Ibo


/1 Site n'ebe di anya ka Jehova mere ka m'hu Ya, si, O bu ihun'anya nke di mbe 
ebigh-ebi ka M'jiworo hu gi n'anya: n'ihi nka ka M'meworo ka ebere digidere 
gi.
Ma Chineke neme ka ihun'anya nke aka Ya n'ebe ayi no puta ihe, n'ihi na, mbe 
ayi no nabu ndi-nmehie, Kraist nwuru n'ihi ayi.
Nke si kwa n'aka Jisus Kraist puta, Onye bu onye-ama kwesiri ntukwasiobi, onye 
eburu uzo mu n'etiti ndi nwuru anwu, buru kwa onye-isi nke ndi-eze uwa. Onye 
ahu Nke nahu ayi n'anya, Onye topu-kwa-ra ayi na nmehie nile ayi nime 
obara-Ya.
O digh onye o bula nwere ihun'anya kari nka uku, ka madu tobo ndu-ya n'ihi 
ndi-eyi-ya.
N'ihi na Chineke huru uwa n'anya otu a, na O nyere obuna Okpara O muru nani 
Ya, ka onye o bula nke kwere na Ya we ghara ila n'iyi, kama ka o nwe ndu 
ebigh-ebi.

/2 O bu kwa ihe anekwuputa na o di uku, bu ihe-umimi nke nsopuru-Chineke; Onye 
ahu Nke emere ka O puta ihe n'anu-aru, Nke aguru Ya n'onye ezi omume nime mo, 
Nke emere ka ndi-moozi hu Ya anya, Nke ekwusara Ya n'etiti ndi mba ozo, Nke 
ekwere na Ya nime uwa, Nke anara Ya n'elu nime ebube.
Na mbu ka Okwu ahu diri, Okwu ahu na Chineke di-kwara, Okwu ahu buru kwa 
Chineke.
Okwu ahu we gho anu-aru, bu madu, O we biri n'etiti ayi, (ayi kiri-kwa-ra 
otuto-Ya, bu otuto dika otu nwa-nwoke amuru nani ya nanata n'aka nna-ya), O 
juputara n'amara na ezi-okwu.
Onye hurorom anya ahuwo Nnam anya; gi onwe-gi si ana si, Gosi ayi Nna ahu? I 
kwegh na Mu onwem no nime Nnam, Nnam no kwa nimem?
Ma ihe a dum emewo, ka okwu Onye-nwe-ayi kwuru site n'onu onye-amuma-Ya we 
mezu, si, Le, nwa-abogho ahu namagh nwoke gadi ime, o gamuta kwa Nwa nwoke, 
Ha gakpo kwa aha-Ya Immanuel; nke bu, ma asugharia ya, Chineke noyere ayi.

/3 Onye o bula nke gekwuputa na Jisus bu Okpara Chineke, Chineke nanogide nime 
ya, ya onwe-ya nanogide kwa nime Chineke.
N'ihi na nime Ya ka ozuzu nile nke ihe Chineke bu nebigide newere aru madu.
N'ihi na amuworo ayi otu nwa, otu nwa-nwoke ka enyeworo ayi; ibu-onye-isi 
gadikwasi kwa n'ubu-ya: agakpo kwa ahaya Onye-ebube, Onye-ndum-odu, Chineke 
Nke bu Dike, Nna Nke bu Nna mbe nile ebigh-ebi, Onye-isi Udo.
Mo-ozi ahu we za, si ya, Mo Nso gabiakwasi gi, ike nke Onye kachasi ihe nile 
elu gekpuchi kwa gi: n'ihi nka Ihe di nso nke i di ime Ya, agakpo Ya Okpara 
Chineke.
Mbe o kpu okwu n'onu, le, igwe-oji nke nenwu enwu kpuchiri ha: le kwa, olu si 
n'igwe-oji ahu puta, si, Onye a bu Okparam M'huru n'anya, Onye ihe-Ya dim ezi 
nma; nurunu okwu-Ya.

/4 Ya mere Jisus siri ha ozo, N'ezie, n'ezie, asim unu, Mu onwem bu onu-uzo 
nke aturu.
Unu onwe-unu nakpom, Onye-ozizi, na, Onye-nwe-ayi: unu nekwu kwa nke-oma; 
n'ihi na o bu otu M'di.
Jisus siri ha, N'ezie, n'ezie, asim unu, Mbe akamugh Abraham Mu onwem di.
Mbe o bula M'no n'uwa, abum ihe nke uwa.
Jisus siri ya, Mu onwem bu nbilite-n'onwu na ndu: onye nekwere na Mu, obuna ma 
asi na o nwuru anwu, o gadi ndu ozo.
Jisus siri ha, Mu onwem bu nri nenye ndu: onye nabiakutem, agu agagh-agu ya 
ma-oli, onye nekwere kwa na Mu akpiri agagh-akpo ya nku ma-oli mbe o bula.
O we si ha, Unu onwe-unu si n'ebe di ala puta; Mu onwem si n'ebe di elu puta: 
unu onwe-unu si n'uwa nka puta; Mu onwem esigh n'uwa nka puta.

/5 Ma mbe O kwubiri okwu, O si Saimon, Nupu n'obu-miri, wuyenu ihe unu ji ebu 
azu ka unu bue azu.
Saimon we za, si, Nnaayi, ayi doburu onwe-ayi n'olu ogologo abali a dum, ma 
ayi ebutagh ihe o bula: ma n'okwu-Gi m'gawuye ihe eji ebu azu.
Mbe ha mesiri nka, ha we nwuta oke igwe azu; ihe-ha eji ebu azu we nadoka.
Ma le, ndi-isi abua ndi nanodu n'akuku uzo, mbe ha nuru na Jisus nagabiga, ha 
tie nkpu, si, Onye-nwe-ayi, mere ayi ebere, Nwa Devid.
Ma Jisus, ebe O nwere omiko n'aru-ha, O we metu anya-ha aka: ngwa ngwa ewe me 
ka ha hu uzo, ha we so Ya.
O we gwa igwe madu nile ka ha nodu n'elu ahihia; O we nara obe achicha ise na 
azu abua ahu, le anya n'elu-igwe, gozie ha, nyawa, we nenye ndi neso uzo-Ya 
obe achicha ahu, ndi neso uzo-Ya nenye kwa igwe madu nile.
Ha nile we rie, afo ju-kwa-ra ha: ha we tutuko nke foduru nime iberibe ahu, 
nkata iri na abua juru.
Ma ndi riri ra ka nnu ndikom iri na nnu abua na ogu iri, nagugh ndinyom na 
umu-ntakiri.

/6