The Old Testament of the Holy Bible

Jenesis 1

1 Na mbu Chineke kere elu-igwe na uwa. 2 Uwa we buru ihe tọb͕ọrọ n'efu na ihe tọb͕ọrọ nkití; ọchichiri di kwa n'elu ob͕u-miri: Mọ Chineke nērughari kwa n'elu miri. 3 Chineke we si, Ka ihè di: ìhè we di. 4 Chineke we hu ìhè ahu, na ọ di nma: Chineke we kpa ókè n'etiti ìhè ahu na ọchichiri ahu. 5 Chineke we kpọ ìhè ahu Ehihie, ọchichiri ahu ka Ọ kpọkwara Abali. Anyasi we di, ututu we di, buru otù ubọchi. 6 Chineke we si, Ka mbara di n'ab͕ata miri ahu, ka ọ nọ kwa nākpa ókè n'etiti miri na miri. 7 Chineke we me mbara ahu, kpa ókè n'etiti miri ahu nke di n'okpuru mbara ahu na miri ahu nke di n'elu mbara ahu: ọ we di otú a. 8 Chineke we kpọ mbara ahu Elu-igwe. Anyasi we di, ututu we di, buru ubọchi nke-abua. 9 Chineke we si, Miri ahu nke di n'okpuru elu-igwe, ka achikọta ha n'otù ebe, ka ahú kwa ala-akọrọ: ọ we di otú a. 10 Chineke we kpọ ala-akọrọ ahu Ala; nchikọta miri ahu ka Ọ kpọkwara Oké Osimiri: Chineke we hu na ọ di nma. 11 Chineke we si, Ka ala puputa ahihia ndu, ihe-ọkukú nke nāmiputa nkpuru-ọghigha, osisi mkpuru nke nāmi mkpuru di iche iche, nke mkpuru-ọghi-gha-ya di nime ya, n'elu ala: o we di otú a. 12 Ala we weputa ahihia ndu, ihe-ọkukú nke nāmiputa nkpuru-ọghigha di iche iche, ya na osisi nke nāmi mkpuru di iche iche, nke nkpuru-ọghigha-ya di nime ya: Chineke we hu na ọ di nma. 13 Anyasi we di, ututu we di, buru ubọchi nke-atọ. 14 Chineke we si, Ka ihe nke nēnye ihè di na mbara elu-igwe ikpa ókè n'etiti ehihie na abali; ka ha buru kwa ihe igosi ihe-iriba-ama di iche iche, na igu mb͕e akara àkà, na igu ubọchi na arọ: 15 ka ha buru kwa ihe nēnye ìhè nime mbara elu-igwe inye ìhè n'elu uwa: o we di otú a. 16 Chineke we kpua ihe uku abua ahu nke nēnye ìhè; Ọ kpuru ihe ahu nēnye ìhè nke ka uku ka ọ nāchi ehihie, na ihe ahu nēnye ìhè nke ka ntà ka ọ nāchi abali: Ọ kpukwara kpakpando nile, 17 Chineke we tinye ha nime mbara elu-igwe inye ìhè n'elu uwa, 18 na ichi ehihie na ichi abali, na ikpa ókè n'etiti ìhè na ọchichiri: Chineke we hu na ọ di nma. 19 Anyasi we di, ututu we di, buru ubọchi nke-anọ. 20 Chineke we si, Ka miri nuputa ihe nēnuputa enuputa, bú anu nwere nkpuru-obi di ndu, ka anu-ufe feghari kwa n'elu uwa n'iru mbara elu-igwe. 21 Chineke we kè ogologo anu uku nile di na miri, na anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nke nākpu akpu, nke miri nuputara, di iche iche, na anu-ufe nile ọ bula di iche iche nke nwere nku: Chineke we hu na ọ di nma. 22 Chineke we gọzie ha, si, Muanu ọmùmù, banu uba, juputa miri di n'oké osimiri nile, ka anu-ufe ba kwa uba n'uwa. 23 Anyasi we di, ututu we di, buru ubọchi nke-ise. 24 Chineke we si, Ka ala weputa anu di iche iche nwere nkpuru-obi di ndu, anu-ulo, na ihe nākpu akpu, na anu-ọhia di iche iche nke uwa: o we di otú a. 25 Chineke we me anu-ọhia di iche iche nke uwa, na anu-ulo di iche iche, na ihe nile ọ bula di iche iche nke nākpu akpu n'ala: Chineke we hu na ọ di nma. 26 Chineke we si, Ka ayi kpua madu n'onyinyo-ayi, dika oyiyi-ayi si di: ka ha nwe kwa ike n'aru azù nke oké osimiri, na n'aru anu-ufe nke elu-igwe, na n'aru anu-ulo, na n'aru uwa nile, na n'aru ihe nile ọ bula nākpu akpu nke nākpu akpu n'elu uwa. 27 Chineke we kè madu n'onyinyo-Ya, n'onyinyo Chineke ka O kere ya: nwoke na nwayi ka O kere ha. 28 Chineke we gọzie ha: Chineke we si ha, Muanu ọmùmù, banu uba, juputa uwa, buda ya n'okpuru onwe-unu; nwekwanu ike n'aru azù nke oké osimiri, na n'aru anu-ufe nke elu-igwe, na n'aru anu nile ọ bula di ndu nke nākpu akpu n'elu uwa. 29 Chineke we si, Le, enyewom unu ihe-ọkukú nile ọ bula nāmiputa nkpuru-ọghigha, nke di n'elu uwa nile, na osisi nile ọ bula, nke nkpuru osisi nāmiputa nkpuru-ọghigha di nime ya; unu ka ọ diri ibu ihe-oriri: 30 o bu kwa anu-ọhia nile ọ bula nke uwa ka M'nyeworo akwukwọ ihe-ọkukú nile ọ bula, nye kwa anu-ufe nile ọ bula nke elu-igwe, nye kwa ihe nile ọ bula nke nākpu akpu n'elu uwa, nke nkpuru-obi di ndu di nime ya, ibu ihe-oriri: ọ we di otú a. 31 Chineke we hu ihe nile ọ bula O mere, ma, le, ọ di nma nke-uku. Anyasi we di, ututu we di, buru ubọchi nke-isi. Zeph 1

1 Okwu Jehova nke ruru Zefanaia nwa Kushi, nwa Gedalaia, nwa Amaraia, nwa Hezekaia, nti, n'ubọchi Josaia nwa Emon, bú eze Juda. 2 M'gēkpochapusi ihe nile n'elu uwa; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 3 M'gēkpochapu madu na anumanu; M'gēkpochapu anu-ufe nke elu-igwe, na azù nke oké osimiri, na ihe-isu-ngọngọ nile, ha na ndi nēmebi iwu; M'gēbipu kwa madu n'elu uwa; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 4 M'gēseti kwa akam imegide Juda, na imegide ndi nile bi na Jerusalem; M'gēbipu kwa ndi Beal fọduru n'ebe a, na aha ndi-nchu-àjà arusi, ha na ndi-nchu-àjà nile; 5 na ndi nākpọ isi ala nye usu ihe nile di n'elu-igwe n'elu-ulo nile; na ndi nākpọ isi ala, ndi nāṅuru Jehova iyi, ndi ji kwa Malkam aṅu iyi; 6 na ndi si n'iso Jehova laghachi azu; na ndi nāchọghi Jehova, nājughi kwa ase Ya. 7 Dere du n'iru Onye-nwe-ayi Jehova: n'ihi na ubọchi Jehova di nso: n'ihi na Jehova edoziwo àjà, O dowo ndi Ọ kpọrọ oriri nsọ. 8 Ọ gēru kwa, n'ubọchi àjà Jehova, na M'gēji nmehie ndi-isi, ji kwa nmehie umu eze, ji kwa nmehie ndi nile nēyi uwe ala ọzọ, leta ha. 9 M'gēji kwa nmehie onye ọ bula nke nāmabiga nbata-uzọ leta ya n'ubọchi ahu, bú ndi nēmeju ulo ndi-nwe-ha n'ihe-ike na aghughọ. 10 Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na olu iti-nkpu gēsi n'ọnu-uzọ-ama azù da, ya na ikwasi-ákwá-ike site n'obodo nke-abua, na oké ntiwa site n'ugwu ntà nile. 11 Kwasienu ákwá ike, unu ndi bi na Maktesh, n'ihi na ndi Kenean nile alawo n'iyì: ebipuwo ndi nile eboro ọla-ọcha. 12 Ọ gēru kwa, na mb͕e ahu, na M'gāchiri oriọna chọsie ike nime Jerusalem; M'gēji kwa nmehie ndikom ahu ndi raruru araru n'idi ka manya-vine doro edo leta ha, ndi nāsi n'obi-ha, Jehova agaghi-eme ezi ihe, Ọ gaghi-eme kwa ihe ọjọ. 13 Àkù-ha gāghọ kwa ihe apunaraworo ha, ulo nile ha gāghọ kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu: e, ha gēwu ulo, ma ha agaghi-ebi nime ha; ha gāku kwa ubi-vine, ma ha agaghi-aṅu manya-vine-ha. 14 Oké ubọchi Jehova di nso, ọ di nso, ọ nēme kwa ngwa nke-uku: ge nti olu ubọchi Jehova; dike nēti nkpu di ilu n'ebe ahu. 15 Ubọchi nrubiga-ókè nke iwe ka ubọchi ahu bu, ubọchi ahuhu na nkpab͕u, ubọchi nke ime nkpọnkpọ-ebe na itọb͕ọrọ n'efu, ubọchi ọchichiri na oké nb͕achi, ubọchi igwe-oji na oké ọchichiri, 16 ubọchi opì-ike na iti-nkpu agha, imegide obodo nile ewusiri ike, na imegide ulo-nkuku nile di elu. 17 M'gēme kwa ka nkpà kpa madu, ha ewe jegharia dika ndi-ìsì, n'ihi na ọ bu Jehova ka ha mehieworo megide: agāwusi kwa ọbara-ha dika ájá, wusi kwa anu-aru-ha dika ǹsí. 18 Ọla-ọcha-ha ma-ọbu ọla-edo-ha agaghi-enwe ike inaputa ha anaputa n'ubọchi nrubiga-ókè nke iwe Jehova; ma agēji ọku nke ekworo-Ya ripia ala-ha nile: n'ihi na ngwusi, nke bu nání obi-ọlulọ-miri, ka Ọ gēme ka ndi nile bi n'ala nka gwusia.

Jenesis 2

1 Ewe kesia elu-igwe na uwa, na usu-ha nile. 2 Chineke we jesia ozi-Ya n'ubọchi nke-asa, bú nke O jere; O we kwusi n'ubọchi nke-asa ahu n'ozi-Ya nile nke O jere. 3 Chineke we gọzie ubọchi nke-asa ahu, do kwa ya nsọ: n'ihi na ọ bu nime ya ka Ọ kwusiri n'ozi-Ya nile nke Chineke kereri ekè n'ije ya. 4 Ndia bu usoro okike elu-igwe na uwa mb͕e ekere ha, n'ubọchi ahu mb͕e Jehova, bú Chineke, mere uwa na elu-igwe. 5 Ma osisi ntà ọ bula nke ọhia akādighi n'uwa, ihe-ọkukú ọ bula nke ọhia akēpughi kwa: n'ihi na Jehova, bú Chineke, akēmeghi ka miri zo n'elu uwa, ọ dighi kwa madu di ilu ọlu ubi; 6 ma alulu nēsi n'ala kwugo n'elu, nēdè kwa iru nile nke ala miri. 7 Jehova, bú Chineke, we were ájá sitere n'ala kpuọ madu, O we kuo ume ndu nye n'oghere-imi-ya abua; madu ahu we ghọ nkpuru-obi di ndu. 8 Jehova, bú Chineke, we kua ubi nke ab͕ara ogige n'Iden, n'Iru-anyanwu; O we tinye madu ahu n'ebe ahu, bú onye Ọ kpururi. 9 Jehova, bú Chineke, we me ka osisi nile ọ bula si n'ala pue, bú nke anāchọsi ike n'ile anya, nke di kwa nma ihe-oriri; osisi nke ndu dikwa n'etiti ubi ahu ab͕ara ogige, na osisi nke ima ezi ihe na ihe ọjọ. 10 Osimiri nēsi kwa n'Iden puta idè ubi ahu ab͕ara ogige miri; ewe site n'ebe ahu kewa ya, ọ we ghọ isi miri anọ. 11 Aha osimiri nke-mbu bu Paishon: nke ahu bu nke nāga ala Havila nile gburugburu, ebe ọla-edo di; 12 ọla-edo ala ahu di nma: n'ebe ahu ka bdellium na nkume onyx di. 13 Aha osimiri nke-abua bu Gaihon: nke ahu bu nke nāga ala Etiopia nile buruburu. 14 Aha osimiri nke-atọ bu Hidekel: nke ahu bu nke nāga Asiria n'Iru-anyanwu. Osimiri nke-anọ bu Yufretis. 15 Jehova, bú Chineke, we were madu ahu me ka ọ nọdu n'ubi Iden ab͕ara ogige ilu ọlu-ya na idebe ya. 16 Jehova, bú Chineke, we nye madu ahu iwu, si, Nkpuru nke sitere n'osisi nile ọ bula nke ubi a ab͕ara ogige ka i ganēri eri: 17 ma nkpuru nke sitere n'osisi ima ezi ihe na ihe ọjọ, gi erila nkpuru sitere na ya: n'ihi na n'ubọchi i gēri nkpuru sitere na ya i ghaghi inwu anwu. 18 Jehova, bú Chineke, we si, Ọ dighi nma ka madu ahu nọ nání ya; M'gēmere ya onye-iye-aka kwesiri ya. 19 Jehova, bú Chineke, we site n'ala kpu anu-ọhia nile ọ bula, na anu-ufe nile ọ bula nke elu-igwe; O we me ka ha biakute madu ahu, ihu ihe ọ gākpọ ha: ma aha ọ bula madu ahu nākpọ anu nwere nkpuru-obi di ndu, nke ahu bu aha-ya. 20 Madu ahu we kpọ anu-ulo nile na anu-ufe nke elu-igwe na anu-ọhia nile ọ bula aha; ma madu, ahughi onye-iye-aka kwesiri ya. 21 Jehova, bú Chineke, we me ka oké ura dakwasi madu ahu, o we raru ura; O we weputa otù nime ọgiriga-ya, mechie anu-aru n'ọnọdu-ya: 22 ọgiriga ahu, bú nke O weputara n'aru madu ahu, Jehova, bú Chineke, we wue ya dika ulo ka ọ ghọ nwanyi, O me ka ọ biakute madu ahu. 23 Madu ahu we si, Ehe! nka bu nọ ọkpukpu si n'ọkpukpum puta, na anu-aru si n'anu-arum puta: nka ka agākpọ Nwayi, n'ihi na eweputara nka n'aru Nwoke. 24 N'ihi nka ka nwoke gārapu nna-ya na nne-ya, rapara n'aru nwunye-ya: ha ewe ghọ otù anu-aru. 25 Ha abua we buru ndi b͕a ọtọ, nwoke ahu na nwunye-ya, ma ihere adighi-eme ha.

Jenesis 3

1 Ma agwọ di aghughọ kari anu ọhia ọ bula nke Jehova, bú Chineke, mereri. O we si nwayi ahu, Ọ̀ gābu ezie na Chineke siri, Unu erila nkpuru sitere n'osisi ọ bula nke ubi a ab͕ara ogige? 2 Nwayi we si agwọ ahu, Ayi nēri nkpuru osisi nile nke ubi a ab͕ara ogige: 3 ma nkpuru nke osisi ahu nke di n'etiti ubi a ab͕ara ogige, Chineke asiwo, Unu erila nkpuru sitere na ya, unu emetukwala ya aka, ka unu we ghara inwu anwu. 4 Agwọ we si nwayi, Ọ dighi ọnwu unu nāghaghi inwu: 5 n'ihi na Chineke mara na n'ubọchi unu gēri nkpuru sitere na ya, mb͕e ahu ka agēmeghe anya-unu, unu ewe di ka Chineke, nāma ezi ihe na ihe ọjọ. 6 Nwayi we hu na osisi ahu di nma ihe-oriri, na ọ bu kwa ihe nāgu anya agu ile, na ihe anāchọsi ike ka osisi ahu bu kwa ime ka madu nwe uche, o were ufọdu nime nkpuru-ya, rie; o nye kwa di-ya, tinyere onwe-ya, o we rie. 7 Ewe meghe anya ha abua, ha we mara na ndi b͕a ọto ka ha bu; ha we dukọta akwukwọ osisi fig, mere onwe-ha ihe-ọkiké. 8 Ha we nu olu Jehova, bú Chineke, ka Ọ nējeghari n'ubi ahu ab͕ara ogige mb͕e ifufe nēfe n'ubọchi: madu ahu na nwunye-ya we zopu onwe-ha n'iru Jehova, bú Chineke, n'etiti osisi nke ubi ahu ab͕ara ogige. 9 Jehova, bú Chineke, we kpọ madu ahu òkù, si ya, Òle ebe i nọ? 10 O we si, Anurum olu-Gi n'ubi a ab͕ara ogige, m'we tua egwu, n'ihi na onye b͕a ọtọ ka m'bu; m'we zo onwem. 11 O we si, Ònye gosiri gi na onye b͕a ọtọ ka i bu? Ì riwo nkpuru sitere n'osisi ahu, nke M'nyere gi iwu bayere ya, ka i ghara iri nkpuru sitere na ya? 12 Madu ahu we si, Nwayi ahu nke I nyerem ka mu na ya biri, ya onwe-ya nyerem nkpuru sitere n'osisi ahu, m'we rie. 13 Jehova, bú Chineke, we si nwayi ahu, Gini bu nka i meworo? Nwayi we si, Agwọ ahu rafurum, m'we rie. 14 Jehova, bú Chineke, we si agwọ ahu, N'ihi na i mewo nka, ihe anābu ọnu ka i bu kari anu-ulo nile, na kari anu ọhia nile ọ bula; afọ-gi ka i gēji je ije, ọ bu kwa ájá ka i ganēri ubọchi nile nke ndu-gi: 15 iro ka M'gētiye kwa n'etiti gi na nwayi ahu, na n'etiti nkpuru-gi na nkpuru-ya: nkpuru ahu gēchifia gi n'isi, gi onwe-gi gēchifia kwa ya n'ikiri-ukwu. 16 Nwayi ahu ka Ọ siri, M'gēme ka ihe-nb͕u-gi na itu-ime-gi ba uba nke-uku; n'ihe-nb͕u ka i gāmu umu; n'ebe di-gi nọ ka ọchichọ-gi gādi, ya onwe-ya gāchi kwa gi. 17 Adam ka Ọ sikwara, N'ihi na i gewo nti n'olu nwunye-gi, i we rie nkpuru sitere n'osisi ahu, nke M'nyere gi iwu bayere ya, si, Gi erila nkpuru sitere na ya: ihe anābu ọnu ka ala bu n'ihi gi; n'ihe-nb͕u ka i gēri ihe sitere na ya ubọchi nile nke ndu-gi; 18 o bu kwa ogwu na uke ka ọ gēpuru gi; i gēri kwa ihe-ọkukú nke ubi; 19 n'ọsusọ iru-gi ka i gēri nri, rue mb͕e i gālata n'ala; n'ihi na esiri na ya weputa gi; n'ihi na ájá ka i bu, ọ bu kwa ájá ka i gālata. 20 Madu ahu we kpọ aha nwunye-ya Iv; n'ihi na nwayi ahu bu nne madu nile nwere ndu. 21 Jehova, bú Chineke, we were akpukpọ anu mere Adam, mekwara nwunye-ya, uwe-ime, we yibe ha. 22 Jehova, bú Chineke, we si, Le, madu ahu aghọwo ihe di ka otù onye nime ayi, n'ima ezi ihe na ihe ọjọ; ma ub͕u a, ka o we ghara iseti aka-ya, were nkpuru sitere n'osisi ahu nke ndu, rie, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi: 23 Jehova, bú Chineke, we zipu ya n'ubi Iden ab͕ara ogige, ilu ọlu ala ahu nke esiri na ya weputa ya. 24 O we chupu madu ahu, me ka Cherubim nọdu n'akuku Iru-anyanwu nke ubi Iden ab͕ara ogige, ha na ire-ọku nke mma-agha nke nēchighari onwe-ya, ichebe uzọ osisi ahu nke ndu.

Jenesis 4

1 Madu ahu we mara aru Iv, bú nwunye-ya; o we turu ime, mua Ken, si, Enwetawom nwoke site n'iye-aka Jehova. 2 Ọzọ kwa, ọ mua nwa-nṅe-ya nwoke, bú Ebel. Ebel we buru onye nāzù ìgwè ewu na aturu, ma Ken bu onye nālu ọlu ubi. 3 O rue, n'ọgwugwu ubọchi ufọdu, na Ken wetara ufọdu nime nkpuru ala ibu onyinye-inata-iru-ọma enyere Jehova. 4 Ebel kwa, ya onwe-ya wetakwara ufọdu nime umu eburu uzọ mu nke ìgwè ewu na aturu ya, na ufọdu nime iberibe-ha mara abuba. Jehova we le Ebel, le kwa onyinye-inata-iru-ọma-ya, anya ọma: 5 ma Ken na onyinye-inata-iru-ọma-ya, O leghi ha anya ọma. Ken we we iwe di ọku nke-uku, iru-ya we b͕arua. 6 Jehova we si Ken, N'ìhi gini ka i nēwe iwe di ọku? ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka iru-gi b͕aruru? 7 Ọ buru na i nēme nke-ọma, ọ̀ bughi nb͕asa-iru ka i gēnwe? ọ buru kwa na i meghi nke-ọma, n'ọnu-uzọ ka nmehie nāma-kpu dika anu-ọhia: ọ bu kwa n'ebe i nọ ka ọchichọ-ya di, ma ọ kwesiri ka gi onwe-gi chia ya. 8 Ken we si Ebel, bú nwa-nne-ya, Ka ayi je n'ọhia. O rue, mb͕e ha nọ n'ọhia, na Ken biliri imegide Ebel, bú nwa-nne-ya, we b͕ue ya. 9 Jehova we si Ken, Òle ebe Ebel, bú nwa-nne-gi, nọ? Ọ we si, Amaghm: ọ̀ bu onye-nche nwa-nnem ka m'bu? 10 Ọ si, Gini ka i meworo? ge nti! olu ọbara nwa-nne-gi nētikum site n'ala. 11 Ma ub͕u a, onye anābu ọnu ka i bu site n'ala, nke saghere ọnu-ya inara ọbara nwa-nne-gi n'aka-gi; 12 mb͕e i nālu ọlu ubi, ọ gaghi-enye gi ike-ya ọzọ; onye nāṅaghari na ọsọ ka i gābu n'uwa. 13 Ken we si Jehova, Ahuhu ajọ omumem di uku kari obubu. 14 Le, I chupuwom ta n'iru ala; ọ bu kwa n'iru-Gi ka agēzopum; m'gābu kwa onye nāṅaghari na ọsọ n'uwa; o gēru kwa na onye ọ bula nke nāhum gēb͕um. 15 Jehova we si ya, N'ihi nka onye ọ bula nke nēb͕u Ken, okpukpu asa ka agābọ ọ́bọ̀ n'aru ya. Jehova we doro Ken ihe-iriba-ama, ka onye ọ bula nke nāhu ya we ghara itib͕u ya. 16 Ken we si n'iru Jehova pua, biri n'ala Nod, n'Iru-anyanwu Iden. 17 Ken we mara aru nwunye-ya; ọ we turu ime, mua Inok: ma Ken nọ nēwu obodo, o we kpọ aha obodo ahu, dika aha nwa-ya nwoke si di, Inok. 18 Ewe mua Irad nye Inok: Irad we mua Mehujael: Mehujael we mua Metushael: Metushael we mua Lemek. 19 Lemek we lutara onwe-ya ndinyom abua: aha otù onye nime ha bu Eda, aha nwayi ibe-ya bu Zila. 20 Eda we mua Jebel: onye ahu bu nna ndi bi n'ulo-ikwū, ndi nwe-kwa-ra anu-ulo. 21 Aha nwa-nne-ya nwoke bu Jubal: onye ahu bu nna ndi nile nākpọ ubọ-akwara, nēb͕u kwa ọ̀jà. 22 Zila kwa, nwayi ahu mu-kwa-ra Tubal-ken, onye nākpu ihe-ọlu nile ọ bula nke ọla na nke ígwè: ma nwa-nne-nwayi Tubal-ken bu Neama. 23 Lemek we si ndinyom-ya: Eda na Zila, nurunu olum; Ndinyom Lemek, genu nti n'okwu-ọnum: N'ihi na nwoke ka m'b͕uworo n'ihi ob͕ub͕u-mmam, Ọ bu kwa nwata-nwoke ka m'b͕uworo n'ihi ubiri-utarim: 24 Asi na ọ bu okpukpu asa ka agābọ̀ Ken ọ́bọ̀, Agābọ kwa Lemek ọgu okpukpu atọ na iri na asa. 25 Adam we mara aru nwunye-ya ọzọ; nwunye-ya we mua nwa-nwoke, kpọ aha-ya Set, si, N'ihi na Chineke doworom nkpuru ọzọ n'ọnọdu Ebel; n'ihi na Ken b͕uru ya. 26 Set kwa, ya onwe-ya ka amu-kwa-ra nwa-nwoke nye; ọ kpọ aha-ya Enosh: mb͕e ahu ka amalitere ikpọku aha Jehova.

Jenesis 5

1 Nka bu akwukwọ osuso-ọmumu nile nke Adam. N'ubọchi Chineke kere madu, n'oyiyi Chineke ka O mere ya; 2 nwoke na nwayi ka O kere ha; Ọ gọzie ha, kpọ aha-ha Madu, n'ubọchi ekere ha. 3 Adam we di ndu ọgu arọ isi na iri, ọ mua nwa n'oyiyi-ya, dika onyinyo-ya si di; ọ kpọ aha-ya Set: 4 ubọchi nile nke Adam, mbe ọ musiri Set, bu nnù arọ abua: ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom. 5 Ubọchi nile nke Adam di ndu we buru nnù arọ abua na ọgu isi na iri: o we nwua. 6 Set di ndu ọgu arọ ise na ise, ọ mua Enosh: 7 Set di ndu, mb͕e ọ musiri Enosh, nnù arọ abua na asa, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom: 8 ubọchi nile nke Set we buru nnù arọ abua na ọgu ise na iri na abua: o we nwua. 9 Enosh di ndu ọgu arọ anọ na iri, ọ mua Kenan: 10 Enosh di ndu, mb͕e ọ musiri Kenan, nnù arọ abua na iri na ise, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom: 11 ubọchi nile nke Enosh we buru nnù arọ abua na ọgu ise na ise: o we nwua. 12 Kenan di ndu ọgu arọ atọ na iri, ọ mua Mahalalel: 13 Kenan di ndu, mb͕e ọ musiri Mahalalel, nnù arọ abua na ọgu abua, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom: 14 ubọchi nile nke Kenan we buru nnù arọ abua na ọgu ise na iri: o we nwua. 15 Mahalalel di ndu ọgu arọ atọ na ise, ọ mua Jered: 16 Mahalalel di ndu, mb͕e ọ musiri Jered, nnù arọ abua na oru na iri, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom: 17 ubọchi nile nke Mahalalel we buru nnù arọ abua na ọgu anọ na iri na ise: o we nwua. 18 Jered di ndu ọgu arọ asatọ na abua, ọ mua Inok: 19 Jered di ndu, mb͕e ọ musiri Inok, nnù arọ abua, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom: 20 ubọchi nile nke Jered we buru nnù arọ abua na ọgu asatọ na abua: o we nwua. 21 Inok di ndu ọgu arọ atọ na ise, ọ mua Metusela: 22 Inok na Chineke we yikọ nējeghari, mb͕e ọ musiri Metusela, ọgu arọ iri-na-ise, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom: 23 ubọchi nile nke Inok we buru ọgu arọ iri-na-asatọ na arọ ise: 24 Inok na Chineke we yikọ nējeghari: ọ nọghi kwa: n'ihi na Chineke kuru ya la. 25 Metusela di ndu ọgu arọ iteghete na asa, ọ mua Lemek: 26 Metusela di ndu, mb͕e ọ musiri Lemek, nnù arọ na ọgu iri-na-iteghete na arọ abua, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom: 27 ubọchi nile nke Metusela we buru nnù arọ abua na ọgu asatọ na iteghete: o we nwua. 28 Lemek di ndu ọgu arọ iteghete na abua, ọ mua nwa-nwoke: 29 ọ kpọ aha-ya Noa, si, Onye a gākasi ayi obi banyere ọlu-ayi, banyekwara ndọb͕u ayi ji aka-ayi adọb͕u onwe-ayi n'ọlu, bú nke putara n'ala Jehova buworo ọnu. 30 Lemek di ndu, mb͕e ọ musiri Noa, nnù arọ na ọgu iteghete na iri na ise, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom: 31 ubọchi nile nke Lemek we buru nnù arọ na ọgu iri-na-asatọ na arọ iri na asa: o we nwua. 32 Noa we b͕a nnù arọ na ọgu ise: Noa we mua Shem, na Ham, na Jefet.

Jenesis 6

1 O rue, mb͕e madu malitere iba uba n'elu ala, mb͕e amukwara umu-ndinyóm nye ha, 2 na umu-ndikom nke Chineke huru umu-ndinyom nke madu na ha mara nma; ha we lutara onwe-ha ndinyom site na ndi nile ha rọputara. 3 Jehova we si, Mọm agaghi-achi achi nime madu rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi na ya onwe-ya bu kwa anu-aru: ma ubọchi-ya nile gābu ọgu arọ isi. 4 Nefilim nọ n'uwa na mb͕e ahu, ha nọ kwa ma emesia, mb͕e umu-ndikom nke Chineke nābakuru umu-ndinyom nke madu, mb͕e ha nāmukwara ha umu: ndi ahu bu ndi-dike ahu ndi nọri site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, ndi amara aha-ha. 5 Jehova we hu na ihe ọjọ nke madu riri nne n'uwa, Ọ hu kwa na ncheputa nile ọ bula nke echiche obi-ya bu nání ihe ọjọ ogologo ubọchi nile. 6 Jehova we chegharia na O mere madu n'uwa, ọ we wute Ya n'obi-Ya. 7 Jehova we si, M'gēkpochapu madu n'elu ala, bú ndi M'keworo; ma madu, ma anu-ulo, ma ihe nākpu akpu, ma anu-ufe nke elu-igwe: n'ihi na echeghariwom na emerem ha. 8 Ma Noa hutara amara n'iru Jehova. 9 Ndia bu osuso-ọmumu Noa. Noa bu onye ezi omume, onye zuru okè n'ọb͕ọ-ya nile: Noa na Chineke yikọrọ nējeghari. 10 Noa we mua umu-ndikom atọ, Shem, na Ham, na Jefet. 11 Ma ebibiri uwa n'iru Chineke, uwa juputakwara n'ihe-ike. 12 Chineke we hu uwa, ma, le, ebibiri ya; n'ihi na anu-aru nile, bú madu, bibiri uzọ-ya n'elu uwa. 13 Chineke we si Noa, Ọgwugwu anu-aru nile abiawo n'irum; n'ihi na uwa juputara n'ihe-ike site na ha; ma, le, M'gēbibi ha na uwa. 14 Mere onwe-gi ub͕ọ nke osisi gopher; ulo-nwubi di iche iche ka i gēme n'ub͕ọ ahu, were kwa bitumen techie ya ime na azu. 15 Nka bu kwa otú i gēme ya: ọgú cubit iri-na-ise ka ogologo ub͕ọ ahu bu, ọgu cubit abua na iri bu obosara-ya, orú cubit na iri bu idi-elu-ya. 16 Oghere inye ìhè ka i gēmere ub͕ọ ahu, rue otù cubit ka i gēmesi kwa ya site n'elu; ọnu-uzọ ub͕ọ ahu ka i gētiye kwa n'akuku-ya; okpukpu nke-ala na nke-abua na nke-atọ ka i gēme ya. 17 Ma Mu onwem, le, anameme ka iju-miri biakwasi uwa, ibibi anu-aru nile, nke ume nke ndu di nime ya, ka ọ pua n'okpuru elu-igwe; ihe nile nke di n'uwa gēkubi ume. 18 Ma M'gēme ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n'ebe i nọ; i gābata kwa n'ub͕ọ ahu, gi onwe-gi, na umu-gi ndikom, na nwunye-gi, na nwunye nile nke umu-gi ndikom tiyere onwe-gi. 19 Ọ bu kwa ufọdu nime anu nile ọ bula nke di ndu, nime anu-aru nile, abua abua n'aha nile ọ bula, ka i gēme ka ha bata n'ub͕ọ, idebe ha ndu tiyere onwe-gi; oke na nwunye ka ha gābu. 20 Nime anu-ufe di iche iche, na nime anu-ulo di iche iche, nime ihe nile ọ bula di iche iche nke nākpu n'ala, abua abua n'aha nile ọ bula gābiakute gi, idebe ha ndu. 21 Gi onwe-gi kwa, were n'onwe-gi ufọdu nime ihe-oriri nile nke anēri eri, gi chikọta ya n'ebe i nọ; ọ gāburu gi, bukwara ha, ihe-oriri. 22 Noa we me ya; dika iwu nile si di nke Chineke nyere ya, otú a ka o mere.

Jenesis 7

1 Jehova we si Noa, Ba n'ub͕ọ ahu, gi onwe-gi na ulo-gi nile; n'ihi na gi ka M'huworo bu onye ezi omume n'irum n'ọb͕ọ a. 2 Nime anu nile ọ bula di ọcha i gāchiputara onwe-gi asa asa, oke na nwunye ya; chiputa kwa abua abua n'anu nādighi ọcha, oke na nwunye-ya; 3 ufọdu kwa nime anu-ufe nke elu-igwe, asa asa, oke na nwunye: idebe nkpuru ndu n'elu uwa nile. 4 N'ihi na ọ fọduru ubọchi asa, Mu onwem gaje ime ka miri zosa n'uwa ọgu ubọchi abua ehihie na abali; M'gēkpochapu kwa n'elu ala ihe nile ọ bula di ndu nke M'meworo. 5 Noa we me dika iwu nile si di nke Jehova nyere ya. 6 Noa b͕ara nnù arọ na ọgu iri mb͕e iju-miri ahu di n'elu uwa. 7 Noa we si n'iru miri nke iju-miri ahu ba n'ub͕ọ ahu, ya na umu-ya ndikom na nwunye-ya na nwunye nile nke umu-ya ndikom. 8 Nime anu di ọcha, na nime anu nke nādighi ọcha, na nime anu-ufe na ihe nile ọ bula nke nākpu akpu n'elu ala, 9 abua abua bakuru Noa n'ub͕ọ ahu, oke na nwunye, dika Chineke nyere Noa iwu. 10 O rue, mb͕e ubọchi asa ahu gasiri, na miri nke iju-miri ahu di n'elu uwa. 11 N'arọ nke-nnù-na-ọgu-iri nke ndu Noa, n'ọnwa nke-abua, n'ubọchi nke-iri-na-asa nke ọnwa, n'ubọchi ahu ka ab͕awara isi-iyi nile nke oké ob͕u-miri, emeghe-kwa-ra window nile nke elu-igwe. 12 Oké miri-ozuzo ahu we di n'elu uwa ọgu ubọchi abua ehihie na abali. 13 N'otù ubọchi ahu ka Noa, na Shem na Ham na Jefet, bú umu-ndikom Noa, na nwunye Noa, ha na nwunye nile nke umu-ya ndikom, bara n'ub͕ọ ahu; 14 ha onwe-ha, na anu-ọhia nile ọ bula di iche iche, na anu-ulo nile ọ bula di iche iche, na ihe nile ọ bula di iche iche nākpu akpu nke nākpu akpu n'elu uwa, na anu-ufe nile ọ bula di iche iche, aha nnunu nile ọ bula. 15 Ha we bakuru Noa n'ub͕ọ ahu, abua abua nime anu-aru nile nke ume nke ndu di nime ya. 16 Ndi nāba n'ub͕ọ bara oke na nwunye sitere n'anu-aru nile, dika Chineke nyere ya iwu: Jehova we mechibido ya uzọ nime. 17 Iju-miri ahu we di n'elu uwa ọgu ubọchi abua; miri ahu we ba uba, bulie ub͕ọ ahu, ewe si n'elu uwa bulie ya elu. 18 Miri ahu di ike, ba uba nke-uku n'elu uwa; ub͕ọ ahu we nāgaghari n'elu miri. 19 Miri ahu di ike nke-uku n'elu uwa; ewe kpuchie ugwu nile di elu nke di n'okpuru elu-igwe nile. 20 Cubit iri na ise ka miri ahu di ike site n'elu ugwu; ewe kpuchie ugwu nile. 21 Anu-aru nile nke nākpu akpu n'elu uwa we kubie ume, nime anu-ufe, na nime anu-ulo, na nime anu-ọhia, na nime ihe nile ọ bula nēnuputa enuputa nke nēnuputa n'elu uwa, na madu nile ọ bula: 22 ihe ọ bula nke ume nke mọ nke ndu di n'oghere-imi-ya abua, nime ihe nile ọ bula nke di n'ala-ọkpọ-nku, ọ nwuru anwu. 23 O we kpochapu ihe nile ọ bula di ndu nke di n'elu ala, ma madu, ma anumanu, ma ihe nākpu akpu, ma anu-ufe nke elu-igwe: ewe kpochapu ha n'uwa: ọ we fọdu nání Noa na ndi ya na ha nọ n'ub͕ọ ahu. 24 Miri we di ike n'elu uwa ọgu ubọchi asa na iri.

Jenesis 8

1 Ma Chineke chetara Noa, na anu nile di ndu, na anu-ulo nile nke ya na ha nọ n'ub͕ọ; Chineke we me ka ifufe gabiga n'elu uwa, miri we taba; 2 e mechikwara isi-iyi nile nke ob͕u-miri na window nile nke elu-igwe, eb͕ochi-kwa-ra oké miri-ozuzo nēsite n'elu-igwe; 3 miri we si n'elu uwa nālaghachi mb͕e nile: miri ahu we bilata mb͕e ọgu ubọchi asa na iri gwusiri. 4 Ub͕ọ ahu we tọb͕ọrọ n'elu ugwu nke Ararat n'ọnwa nke-asa, n'ubọchi nke-iri-na-asa nke ọnwa ahu. 5 Miri we nēbilata mb͕e nile rue ọnwa nke-iri: n'ọnwa nke-iri ahu, n'ubọchi mbu nke ọnwa, ka ahuru elu ugwu. 6 O rue, mb͕e ọgu ubọchi abua gwusiri, na Noa meghere window nke ub͕ọ o mere: 7 o zipu ugolo ọma, nke púru nāpù nālata, rue mb͕e miri tasiri n'elu uwa. 8 Ọ we si n'ebe ọ nọ zipu nduru, ile ma miri esiwo n'elu ala taba; 9 ma nduru ahu ahughi ebe-izu-ike nye ọbu-ukwu-ya, ọ we laghachikute ya rue n'ub͕ọ, n'ihi na miri ahu di n'elu uwa nile: ọ we setipu aka-ya, were ya, me ka ọ bakute ya nime ub͕ọ. 10 Ọ we che kwa ubọchi asa ọzọ; ọ we si n'ub͕ọ zipu nduru ahu ọzọ; 11 nduru ahu we bakute ya na mb͕e anyasi; ma, le, akwukwọ osisi olive akubitere ọhu di n'ọnu-ya: Noa we mara na miri esiwo n'elu uwa taba. 12 Ọ we che kwa ubọchi asa ọzọ, zipu nduru ahu; ma ọ laghachikuteghi ya ọzọ ma-ọli. 13 O rue, n'arọ nke-nnù na ọgu iri na otù, n'ọnwa mbu, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, na miri siri n'elu uwa tasia: Noa we wezuga ihe-nkpuchi nke ub͕ọ ahu, hu, ma, le, iru ala kpọrọ nku. 14 Ọ bu n'ọnwa nke-abua, n'ubọchi nke-orú-na-asa, ka ala kọsiri. 15 Chineke we gwa Noa okwu, si, 16 Si n'ub͕ọ pua, gi onwe-gi, na nwunye-gi, na umu-gi ndikom, na nwunye nile nke umu-gi ndikom tiyere onwe-gi. 17 Anu nile ọ bula nke di ndu nke gi na ya nọ, bú nke sitere n'anu-aru nile, nime anu-ufe, na nime anu-ulo, na nime ihe nile nākpu akpu nke nākpu akpu n'uwa, gi me ka ha so gi puta; ka ha we nuputa n'uwa, mua ọmùmù, ba uba n'elu uwa. 18 Noa we pua, ya na umu-ya ndikom na nwunye-ya na nwunye nile nke umu-ya ndikom: 19 anu nile ọ bula nke di ndu, ihe nile ọ bula nke nākpu akpu, na anu-ufe nile ọ bula, ihe ọ bula nke nākpu akpu n'elu uwa, dika ab͕uru-ha si di, ha siri n'ub͕ọ pua. 20 Noa we wuere Jehova ebe-ichu-aja, were ufọdu nime anu-ulo nile ọ bula di ọcha na nime anu-ufe nile ọ bula di ọcha, sure àjà-nsure-ọku n'ebe-ichu-aja ahu. 21 Jehova we nu ísì utọ ya; Jehova we gwa obi-Ya okwu, si, M'gaghi-akọcha ala ọzọ ma-ọli n'ihi madu, n'ihi na ncheputa nke obi madu di njọ site na nwata; M'gaghi-etib͕u kwa ihe nile ọ bula di ndu ọzọ ma-ọli, dika M'meworo. 22 Rue ubọchi nile nke uwa, ọghigha-nkpuru na owuwe-ihe-ubi, na oyi na okpom-ọku, na udumiri na ọkọchi, na ehihie na abali, agaghi-ebì.

Jenesis 9

1 Chineke we gọzie Noa na umu-ya ndikom, si ha, Muanu ọmùmù, banu uba, juputa uwa. 2 Egwù-unu na ujọ-unu gādikwasi n'anu nile ọ bula nke uwa nke di ndu, na n'anu-ufe nile ọ bula nke elu-igwe; tiyere ihe nile ọ bula nke ala nēnuputa, tiye-kwa-ra azù nile nke oké osimiri, n'aka-unu ka enyeworo ha. 3 Ihe nile ọ bula nke nākpu akpu, nke di ndu, gāburu unu ihe-oriri; dika akwukwọ ihe-ọkukú ka M'nyeworo unu ha nile. 4 Nání anu-aru nke ndu-ya, bú ọbara-ya, di nime ya ka unu nāgaghi-eri. 5 N'ezie ọbara-unu, bú nke diri ndu-unu, ka M'gajuta kwa; n'aka anu nile ọ bula di ndu ka M'gājuta ya: ọ bu kwa n'aka madu, n'aka nwa-nne madu ọ bula, ka M'gājuta ndu madu. 6 Onye nāwusi ọbara madu, site n'aka madu ka agāwusi ọbara-ya: n'ihi na ọ bu n'onyinyo Chineke ka O mere madu. 7 Unu onwe-unu kwa, muanu ọmùmù, banu uba; nuputanu umu n'uwa, ba uba nime ya. 8 Chineke we gwa Noa, gwa kwa umu-ya ndikom tiyere ya, okwu, si, 9 Mu onwem kwa, le, M'ganēme ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n'ebe unu nọ, na n'ebe nkpuru-unu nọ, bú ndi gānọchi unu; 10 na n'ebe anu nile ọ bula nke nwere nkpuru-obi di ndu di nke dinyere unu, nime anu-ufe, na nime anu-ulo, na nime anu-ọhia nile ọ bula nke uwa nke dinyere unu; bú nke sitere n'ihe nile nēsi n'ub͕ọ ahu puta, bú anu-ọhia nile ọ bula nke uwa. 11 M'gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n'ebe unu nọ: agaghi-ebipu kwa anu-aru nile ọzọ site na miri nke iju-miri ahu; iju-miri agaghi-adi kwa ọzọ ibibi uwa. 12 Chineke we si, Nka bu ihe-iriba-ama nke ọb͕ub͕a-ndu ahu nke Mu onwem nāb͕a n'etiti Mu na unu na anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nke diyere unu, rue ọb͕ọ nile ebighi-ebi: 13 eke na ogwurugwu m ka tinyeworo n'igwe-oji, ọ gāghọ kwa ihe-iriba-ama nke ọb͕ub͕a-ndu di n'etiti Mu na uwa. 14 Ọ gēru kwa, mb͕e M'nēme ka igwe-oji puta n'elu uwa, na agāhu eke-na-ogwurugwu ahu n'igwe-oji ahu, 15 M'we cheta ọb͕ub͕a-ndum, nke di n'etiti mu na unu na anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nime anu-aru nile; miri agaghi-aghọ kwa iju-miri ọzọ ibibi anu-aru nile. 16 Eke-na-ogwurugwu ahu gādi kwa n'igwe-oji; M'gāhu kwa ya anya, icheta ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi di n'etiti Chineke na anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nime anu-aru nile nke di n'elu uwa. 17 Chineke we si Noa, Nka bu ihe-iriba-ama nke ọbub͕a-ndu ahu nke M'meworo ka o guzosie ike n'etiti Mu na anu-aru nile nke di n'elu uwa. 18 Umu-ndikom Noa, ndi siri n'ub͕ọ ahu pua, bu Shem, na Ham, na Jefet: ma Ham bu nna Kenean. 19 Ndia atọ bu umu-ndikom Noa: ọ bu kwa site na ndia ka uwa nile b͕asara. 20 Noa, bú onye-ọlu-ubi, we malite iku ubi-vine: 21 ọ we ṅua ufọdu nime manya-vine-ya, ṅubiga ókè, b͕aba onwe-ya ọtọ n'etiti ulo-ikwū-ya. 22 Ham, bú nna Kenean, we hu ọtọ nna-ya, gosi umu-nne-ya ndikom abua n'èzí. 23 Shem na Jefet we chiri uwe-nb͕okwasi, tukwasi n'ubu ha abua, were azu-ha je, kpuchie ọtọ nna-ha; ma iru-ha di n'azu, ha ahughi kwa ọtọ nna-ha. 24 Noa we teta n'ura manya-vine-ya, mara ihe nwa-ya nwoke nke-ntà mere ya. 25 Ọ we si, Onye anābu ọnu ka Kenean bu; Orù nke ndi-orù ka ọ gāburu umu-nne-ya ndikom. 26 Ọ si kwa, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke nke Shem, bu; Ka Kenean ghọkwara ha orù. 27 Ka Chineke me ka Jefet setia, Ya biri kwa n'ulo-ikwū nile nke Shem; Ka Kenean ghọ-kwa-ra ha orù. 28 Noa we di ndu, mb͕e iju-miri ahu gasiri, ọgu arọ iri-na-asa na arọ iri. 29 Ubọchi nile nke Noa we buru nnù arọ abua na ọgu asa na iri: o we nwua.

Jenesis 10

1 Ma ndia bu osuso-ọmumu umu-ndikom Noa, bú Shem na Ham na Jefet: amukwara ha umu-ndikom, mb͕e iju-miri ahu gasiri. 2 Umu-ndikom Jefet; Goma, na Megog, na Madai, na Jevan, na Tubal, na Meshek, na Tiras. 3 Umu-ndikom Goma kwa; Ashkenaz, na Rifat, na Togama. 4 Umu-ndikom Jevan kwa; Elaisha, na Tashish, na Kitim, na Dodanim. 5 Site na ndia ka ekesara ala nile di oké osimiri buruburu nke mba nile, n'ala nile ha, onye ọ bula dika asusu-ya si di; dika ab͕uru-ha nile si di, nime mba nile ha. 6 Umu-ndikom Ham kwa; Kush, na Mizraim, na Put, na Kenean. 7 Umu-ndikom Kush kwa; Seba, na Havila, na Sabta, na Reama, na Sabteka: umu-ndikom Reama kwa; Sheba, na Dedan. 8 Kush muru Nimrod; onye ahu malitere ibu dike n'uwa. 9 Ya onwe-ya bu dike n'ichu-ntá n'iru Jehova: n'ihi nka ka anāsi, Dika Nimrod, bú dike n'ichu-ntá n'iru Jehova. 10 Nmalite ala-eze-ya bu Bebel, na Erek, na Akad, na Kalne, n'ala Shaina. 11 O siri n'ala ahu pua je Asiria, wue Nineve, na Rehobot-Ia, na Kala, 12 na Resen n'etiti Nineve na Kala (nke ahu bu obodo uku ahu). 13 Mizraim muru Ludim, na Anamim, na Lehabim, na Naftuhim, 14 na Patrusim, na Kasluhim (ebe ndi Filistia siri puta), na Kaftorim. 15 Kenean muru Zaidon, bú ọkpara-ya, na Het; 16 na ndi Jebus, na ndi-Amorait, na ndi-Giagashait; 17 na ndi-Haivait, na ndi Aka, na ndi Sin; 18 na ndi Avad, na ndi Zemar, na ndi Hemat: emesia ab͕uru nile nke ndi Kenean we b͕asa. 19 Ókè-ala nke ndi Kenean we buru site na Zaidon, mb͕e i nēje Gera, rue Geza: mb͕e i nēje Sọdọm na Gọmọra na Adma na Zeboim, rue Lesha. 20 Ndia bu umu-ndikom Ham, dika ab͕uru nile ha si di, dika asusu nile ha si di, n'ala nile ha, nime mba nile ha. 21 Shem kwa, amukwara umu nye ya onwe-ya, ọ bu nna umu nile nke Iba, nwa-nne nke-okenye nke Jefet. 22 Umu-ndikom Shem; Ilam, na Ashua, na Apakshad, na Lud, na Eram. 23 Umu-ndikom Eram kwa; Uz, na Hul, na Geta, na Mash. 24 Apakshad muru Shela; Shela muru Iba. 25 Amuru umu-ndikom abua nye Iba: aha otù nime ha bu Peleg; n'ihi na ọ bu n'ubọchi-ya ka ekewara uwa; aha nwa-nne-ya nwoke bu Jọktan. 26 Jọktan muru Almodad, na Shelef, na Hazamavet, na Jera; 27 na Hadoram, na Uzal, na Dikla; 28 na Obal, na Abimael, na Sheba; 29 na Ofia, na Havila, na Jobab: ndia nile bu umu-ndikom Jọktan. 30 Ebe-obibi-ha we buru site na Misha, mb͕e i nēje Sefa, ugwu nke Iru-anyanwu. 31 Ndia bu umu-ndikom Shem, dika ab͕uru nile ha si di, dika asusu nile ha si di, n'ala nile ha, dika mba nile ha si di. 32 Ndia bu ab͕uru umu-ndikom Noa, dika osuso-ọmumu nile ha si di, nime mba nile ha: site kwa na ndia ka ekesara mba nile n'uwa, mb͕e iju-miri ahu gasiri.

Jenesis 11

1 Uwa nile we nwe otù asusu na otù uzọ okwu. 2 O rue, mb͕e ha buliri ije n'Iru-anyanwu, na ha chọtara ala di lari n'ala Shaina; ha we biri n'ebe ahu. 3 Ha we sirita ibe-ha, Ngwa, ka ayi kpua brick, kpọ ha ọku nke-ọma. Ha we nwe "brick'' n'ọnọdu nkume, ọ bu kwa bitumen ka ha nwere n'ọnọdu urọ. 4 Ha we si, Ngwa, ka ayi wuere onwe-ayi obodo, na ulo-elu, nke elu-ya gēru n'elu-igwe, ka ayi mekwara onwe-ayi aha; ka ayi we ghara ib͕asa n'elu uwa nile. 5 Jehova we ridata ihu obodo ahu na ulo-elu ahu, nke umu madu wuru. 6 Jehova we si, Le, ha bu otù ndi, ọ bu kwa otù asusu ka ha nile nwere; nka bu kwa ihe ha nāmalite ime: ub͕u a agaghi-eb͕ochiri ha ihe ọ bula nke ha nēzube ime. 7 Ngwa, ka ayi rida, ghagbue asusu-ha n'ebe ahu, ka ha we ghara inurita asusu ibe-ha. 8 Jehova we me ka ha si n'ebe ahu b͕asa n'elu uwa nile: ha we rapu iwu obodo ahu. 9 N'ihi nka ka akpọrọ aha-ya Bebel; n'ihi na n'ebe ahu ka Jehova ghab͕uru asusu uwa nile: ọ bu kwa n'ebe ahu ka Jehova mere ka ha si b͕asa n'elu uwa nile. 10 Ndia bu usoro-ọmumu Shem. Shem b͕ara ọgu arọ ise, mua Apakshad arọ abua ka iju-miri ahu gasiri: 11 Shem di ndu, mb͕e ọ musiri Apakshad, nnù arọ na ọgu ise, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom. 12 Apakshad di ndu orú arọ na iri na ise, mua Shela: 13 Apakshad di ndu, mb͕e ọ musiri Shela, nnù arọ na atọ, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom. 14 Shela di ndu orú arọ na iri, mua Iba: 15 Shela di ndu, mb͕e ọ musiri Iba, nnù arọ na atọ, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom. 16 Iba di ndu orú arọ na iri na anọ, mua Peleg: 17 Iba di ndu, mb͕e ọ musiri Peleg, nnù arọ na orú na iri, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom. 18 Peleg di ndu orú arọ na iri, mua Reu: 19 Peleg di ndu, mb͕e ọ musiri Reu, ọgu arọ iri na arọ iteghete, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom. 20 Reu di ndu orú arọ na iri na abua, mua Serug: 21 Reu di ndu, mb͕e ọ musiri Serug, ọgu arọ iri na arọ asa, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom. 22 Serug di ndu orú arọ na iri, mua Nehoa: 23 Serug di ndu, mb͕e ọ musiri Nehoa, ọgu arọ iri, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom. 24 Nehoa di ndu orú arọ na iteghete, mua Tira: 25 Nehoa di ndu, mb͕e ọ musiri Tira, ọgu arọ ise na iri na iteghete, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom. 26 Tira di ndu ọgu arọ atọ na iri, mua Abram, na Nehoa, na Heran. 27 Ma ndia bu osuso-ọmumu Tira. Tira muru Abram na Nehoa na Heran; Heran muru Lot. 28 Heran we nwua n'iru nna-ya Tira n'ala amuru ya, n'Ua nke ndi Kaldea. 29 Abram na Nehoa we lutara onwe-ha nwunye; aha nwunye Abram bu Serai; aha nwunye Nehoa bu Milka, nwa-nwayi Heran, bú nna Milka na nna Iska. 30 Ma Serai bu nwayi-àgà; ọ dighi nwa ọ nwere. 31 Tira we chiri Abram, bú nwa-ya nwoke, na Lot, bú nwa-nwoke nke Heran, ya bu nwa nwa-ya, na Serai, bú nwunye nwa-ya, bú nwunye Abram nwa-ya nwoke; ha na ha we si n'Ua nke ndi Kaldea pua, ije ala Kenean; ha biarue Heran, biri n'ebe ahu. 32 Ubọchi nile nke Tira we buru ọgu arọ iri na arọ ise: Tira we nwua nime Heran.

Jenesis 12

1 Jehova we si Abram, Si n'ala-gi, si kwa n'umu-nna-gi, si kwa n'ulo nna-gi, je nke gi rue ala ahu nke M'gēme ka i hu ya anya: 2 M'gēme kwa gi ka i ghọ mba uku, M'gāgọzi kwa gi, me ka aha-gi di uku; gi buru kwa ngọzi: 3 M'gāgọzi kwa ndi nāgọzi gi, ọ bu kwa onye nākọcha gi ka M'gābu ọnu: agāgọzi kwa ab͕uru nile nke uwa nime gi. 4 Abram we je, dika Jehova gwara ya okwu; Lot we so ya je: Abram b͕ara ọgu arọ atọ na iri na ise mb͕e o siri na Heran pua. 5 Abram we chiri Serai, bú nwunye-ya, na Lot, bú nwa nwa-nne-ya, na àkù-ha nile nke ha kpatarari, na madu ndi ha nwetarari nime Heran; ha we pua ije ala Kenean; ha we ba n'ala Kenean. 6 Abram we gabiga n'ala ahu rue ebe Shekem, rue osisi terebinth nke More. Ndi Kenean nọ n'ala ahu mb͕e ahu. 7 Jehova we me ka Abram hu Ya anya, Ọ si, Nkpuru-gi ka M'gēwere ala nka nye: ọ we wuere Jehova, bú Onye ahu Nke mere ka ọ hu Ya anya, ebe-ichu-aja n'ebe ahu. 8 Ọ we si n'ebe ahu kwapu je ugwu ahu di n'Iru-anyanwu Bet-el, ọ ma ulo-ikwū-ya, Bet-el di n'Ọdida-anyanwu, Ai di n'Iru-anyanwu: o wuere Jehova ebe-ichu-aja n'ebe ahu, kpọkue aha Jehova. 9 Abram we bulie ije, nēje nēbuli kwa ije n'uzọ Negeb. 10 Oké unwu we di n'ala ahu: Abram we ridarue Ijipt inọ n'ebe ahu dika ọbìa; n'ihi na oké unwu ahu di ike n'ala. 11 O rue, mb͕e ọ biaruru nso iba n'Ijipt, na ọ siri Serai, bú nwunye-ya, Biko, le, amaram na nwayi mara nma ile anya ka i bu: 12 O gēru kwa, mb͕e ndi Ijipt gāhu gi, na ha gāsi, Nwunye-ya ka nwayi a bu: ha ewe b͕uem, ma gi ka ha gēdebe ndu. 13 Biko, si na ọ bu nwa-nnem nwayi ka i bu: ka ọ we dirim nma n'ihi gi, ka nkpuru-obim we di kwa ndu n'ihi gi. 14 O rue, mb͕e Abram batara n'Ijipt, na ndi Ijipt huru nwayi ahu na nwayi mara nma nke-uku ka ọ bu. 15 Ndi-isi Fero we hu ya, too ya n'iru Fero: ewe kubata nwayi ahu n'ulo Fero. 16 Ọ we me Abram nke-ọma n'ihi ya: ọ we nwe ìgwè ewu na aturu, na ìgwè ehi, na oke-inyinya-ibu, na ndi-orù ndikom, na ndinyom nēje ozi, na nne-inyinya-ibu, na kamel. 17 Ma Jehova were ihe-ọjọọ uku di iche iche tie Fero na ulo-ya n'ihi okwu bayere Serai, bú nwunye Abram. 18 Fero we kpọ Abram, si, Gini bu nka i meworom? n'ìhi gini ka a nēgosighm na nwunye-gi ka ọ bu? 19 N'ihi gini ka i siri, Nwa-nnem nwayi ka ọ bu? m'we luta ya n'onwem na nwunye: ma ub͕u a, le nwunye-gi, kuru ya, la. 20 Fero we nye ndikom ufọdu iwu bayere ya: ha we zilaga ya na nwunye-ya na ihe nile nke ọ nwere.

Jenesis 13

1 Abram we si n'Ijipt rigo, ya onwe-ya, na nwunye-ya, na ihe nile ọ nwere, na Lot tiyere ya, rue Negeb. 2 Abram bu kwa ọgaranya nke-uku n'anu-ulo na n'ọla-ọcha, na n'ọla-edo. 3 O si na Negeb je na nbuli-ije-ya we rue Bet-el, rue ebe ahu ebe ulo-ikwū-ya diri site na nmalite, n'etiti Bet-el na Ai; 4 rue ọnọdu nke ebe-ichu-aja ahu nke ọ mereri n'ebe ahu na mbu: Abram we kpọkue aha Jehova n'ebe ahu. 5 Ọzọ kwa, Lot, onye ya na Abram nāyikọ je, ọ nwere igwè ewu na aturu, na igwè ehi, na ọtutu ulo-ikwū. 6 Ala ahu anagideghi ha, ibikọ n'otù: n'ihi na àkù-ha riri nne, ha apughi kwa ibikọ n'otù. 7 Ise-okwu we di n'etiti ndi-ọzùzù anu-ulo Abram na ndi-ọzùzù anu-ulo Lot: ndi Kenean na ndi-Perizait nēbi kwa n'ala ahu mb͕e ahu. 8 Abram we si Lot, Biko, ka ise-okwu ghara idi n'etiti mu na gi, na n'etiti ndi-ọzùzù anu-ulo nkem na ndi-ọzùzù anu-ulo nke gi; n'ihi na nwa-nne ka ayi bu. 9 Ala nka nile, ọ̀ dighi n'iru gi? biko, kewapu onwe-gi n'arum: ọ buru aka-ekpe, m'gēje kwa n'aka-nri: ma ọ buru aka-nri, m'gēje kwa n'aka-ekpe. 10 Lot we welie anya-ya abua, hu Gburugburu-ala nile nke Jọdan, na ala ahu nile bu ala miri nēdè nke-ọma, tupu Jehova ebibie Sọdọm na Gọmọra, dika ubi Jehova ab͕ara ogige, dika ala Ijipt, mb͕e i nēje Zoa. 11 Lot we rọputara onwe-ya Gburugburu-ala nile nke Jọdan; Lot we bulie ije je n'Iru-anyanwu: ha we kewapu onwe-ha otù n'aru nwa-nne-ya. 12 Abram biri n'ala kenean, ma Lot biri n'obodo nke Buruburu-ala ahu, ropu ulo-ikwū-ya je rue Sọdọm. 13 Ma ndi Sọdọm bu ndi ọjọ na ndi-nmehie megide Jehova nke-uku. 14 Ma Jehova siri Abram, mb͕e Lot kewapusiri onwe-ya n'ebe ọ nọ, Biko, welie anya-gi abua, si n'ọnọdu a, ebe gi onwe-gi nọ, le anya n'Ugwu na na Ndida na n'Iru-anyanwu na n'Ọdida-anyanwu: 15 n'ihi na ala nka nile nke gi onwe-gi nāhu anya, gi ka M'gēnye ya, nye kwa nkpuru-gi rue mb͕e ebighi-ebi. 16 M'gēme kwa ka nkpuru-gi di ka ájá nke ala: ya bu na, ọ buru na madu puru iguta ájá nke ala, agāguta kwa nkpuru-gi. 17 Bilie, jegharia n'ala nka n'ogologo-ya na n'obosara-ya; n'ihi na gi ka M'gēnye ya. 18 Abram we ropu ulo-ikwū-ya, bia biri n'etiti osisi terebinth nke Mamre, nke di nime Hebron, o wuere Jehova ebe-ichu-aja n'ebe ahu.

Jenesis 14

1 O rue, n'ubọchi nke Amrafel, bú eze Shaina, na nke Ariok, bú eze Elasa, na nke Kedoalaoma, bú eze Ilam, na nke Taidal, bú eze Goyim, 2 na ha buru agha megide Bira, bú eze Sọdọm, megide kwa Biasha, bú eze Gọmọra, na Shainab, bú eze Adma, na Shemiba, bú eze Zeboyim, na eze Bila (nke ahu bu Zoa). 3 Ndia nile jikọtara onwe-ha n'otù na ndagwurugwu Sidim (nke ahu bu Oké Osimiri Nnú). 4 Arọ iri na abua ka ha fere Kedoalaoma, n'arọ nke-iri-na-atọ ha we nupu isi. 5 N'arọ nke-iri-na-anọ Kedoalaoma we bia, ya na ndi-eze ndi ya na ha yikọrọ, ha tib͕ue Refaim n'Ashterot-Kanaim, na Zuzim nime Ham, na Imim nime Shave-kiriataim, 6 na ndi Hoa n'ugwu-ha, bú Sia, rue El-peran, nke di n'akuku ọzara. 7 Ha we chigharia, bia En-mishpat (nke ahu bu Kedesh), tib͕ue ndi bi n'ọhia nile nke ndi Amalek, tib͕u kwa ndi-Amorait, ndi bi na Hazazon-tema. 8 Eze Sọdọm na eze Gọmọra na eze Adma na eze Zeboyim na eze Bila (nke ahu bu Zoa) we pua, do agha n'usoro imegide ha nime ndagwurugwu Sidim; 9 imegide Kedoalaoma, bú eze Ilam, na Taidal, bú eze Goyim, na Amrafel, bú eze Shaina, na Ariok, bú eze Elasa; eze anọ megide eze ise ahu. 10 Ma ndagwurugwu Sidim bu nání olùlù olùlù nke bitumen; ndi-eze Sọdọm na Gọmọra we b͕alaga, da n'ebe ahu, ndi fọduru we b͕alaga n'ugwu. 11 Ha we chiri àkù nile nke Sọdọm na Gọmọra, na ihe-oriri-ha nile, la. 12 Ha chiri kwa Lot na àkù-ya la, bú nwa nwa-nne Abram, n'ihi na ya onwe-ya bi na Sọdọm. 13 Onye b͕apuru ab͕apu we bia gosi Abram, bú onye-Hibru: ma ya onwe-ya bi n'etiti osisi terebinth nke Mamre, bú onye-Amorait, nwa-nne Eshkol, na nwa-nne Ana; ndi ahu bu kwa ndi ha na Abram di n'ọb͕ub͕a-ndu. 14 Mb͕e Abram nuru na adọtara nwa-nne-ya n'agha, ọ chiputa ndi-ya eziri ibu agha, bú ndi amuru n'ulo-ya, ọgu iri-na-ise na iri na asatọ, ọ we nāchu ha rue Dan. 15 Ọ we kesa onwe-ya imegide ha n'abali, ya onwe-ya na ndi-orù-ya, o tib͕ue ha, chua ha rue Hoba, nke di n'aka-ekpe Damaskọs. 16 Ọ we chilata àkù nile, ọzọ kwa, Lot, bú nwa-nne-ya, na àkù-ya ka ọ chilatara, ndinyom kwa, na ndi ahu. 17 Eze Sọdọm we pua izute ya, mb͕e o siri na ntib͕u nke Kedoalaoma na ndi-eze ahu, bú ndi ya na ha yikọrọ, latasia, rue ndagwurugwu Shave (nke ahu bu Ndagwurugwu Eze). 18 Melkizedek, bú eze Selem, we buputa achicha na manya-vine: onye ahu bu kwa onye-nchu-aja diri Chineke Nke kachasi ihe nile elu. 19 Ọ we gọzie ya, si, Onye agọziri agọzi ka Abram bu site n'aka Chineke Nke kachasi ihe nile elu, bú Onye-nwe elu-igwe na uwa: 20 ọ bu kwa Onye agọziri agọzi ka Chineke Nke kachasi ihe nile elu bu, Onye raworo ndi nākpab͕u gi nye n'aka-gi. Ọ we nye ya otù uzọ n'uzọ iri nime ihe nile. 21 Eze Sọdọm we si Abram, Nyem nání nke bu madu, ma were àkù n'onwe-gi. 22 Abram we si eze Sọdọm, Eweliwom akam nye Jehova, bú Chineke Nke kachasi ihe nile elu, Onye-nwe elu-igwe na uwa, 23 na m'gaghi-ewere ihe ma-ọli nime ihe ọ bula nke i nwere, site n'ogho we rue eriri-akpukpọ-ukwu, ka i we ghara isi, Mu onwem emewo Abram ka ọ buru ọgaranya. 24 Ka ihe ọ bula ghara idirim: nání ihe nke umu-okorọbia ndia riri, na òkè nke ndikom ahu mu na ha yikọrọ je: Ana, na Eshkol, na Mamre, ka ha onwe-ha were òkè-ha.

Jenesis 15

1 Mb͕e ihe ndia gasiri, okwu Jehova ruru Abram nti n'ọhù, si, Atula egwu, Abram: Mu onwem bu ọta diri gi, ugwọ-ọlu-gi riri nne nke-uku. 2 Abram we si, Onye-nwe-ayi, bú Jehova, gini ka I gēnyem, ebe mu onwem gaje ib͕a aka nwa si n'uwa la, ma onye gēnweta ulom bu Damesek Elieza? 3 Abram si kwa, Le, mu ka I nēnyeghi nkpuru: le kwa, nwa-ulom bu onye nēnweta ihem. 4 Ma, le, okwu Jehova ruru ya nti, si, Nwoke a agaghi-enweta ihe-gi; kama onye gēsi n'afọ-gi puta, onye ahu gēnweta ihe-gi. 5 O me ka ọ puta n'èzí, Ọ si, Biko, legide anya n'ebe elu-igwe di, gua kpakpando, ọ buru na i puru igu ha: Ọ si ya, Otú a ka nkpuru-gi gādi. 6 Ọ we kwere na Jehova; Ọ we gua ya nye ya n'ezi omume. 7 Ọ si ya, Mu onwem bu Jehova Nke mere ka i si n'Ua nke ndi Kaldea puta, inye gi ala nka inweta ya. 8 Ọ si, Onye-nwe-ayi, bú Jehova, #m'gēji gini mara na m'gēnweta ya? 9 Ọ si ya, Chirim nwa-ab͕ọghọ-ehi nke b͕ara arọ atọ, na nne-ewu nke b͕ara arọ atọ, na ebulu nke b͕ara arọ atọ, na nduru, na nwa-kpalakwukwu. 10 O we chiri Ya ihe ndia nile, kpọwa ha n'etiti abua, tiye otù nkpọwa na ncherita-iru ibe-ya: ma ọ kpọwaghi nnunu abua ahu. 11 Udele we fedakwasi ozu-anu ahu, ma Abram chuliri ha. 12 O rue, mb͕e anyanwu gaje ida, na oké ura dakwasiri Abram; ma, le, oké ujọ, bú ọchichiri uku, nādakwasi ya. 13 Ọ si Abram, Mara nke-ọma na nkpuru-gi gābu ọbìa n'ala nābughi nke ha, ha gēfè kwa ha; ha gēweda ha ala nnù arọ; 14 ọzọ kwa, mba ahu nke ha gēfè ka M'ganēkpe ikpe: emesia ha gāchiri àkù uku puta. 15 Ma gi onwe-gi gālakuru nna-gi-hà n'udo; agēlì gi n'ezi isi-awọ. 16 Ma n'ọb͕ọ nke-anọ ka ha gālata n'ebe a: n'ihi na ajọ omume ndi-Amorait akēzughi. 17 O rue na, mb͕e anyanwu dasiri, mb͕e ọ b͕a-kwa-ra ọchichiri, le, ite-ọku nke nākwu anwuru, na ọwa nke nēnwu ọku nke gabigara n'etiti iberibe anu ahu. 18 N'ubọchi ahu ka Jehova b͕ara ọb͕ub͕a-ndu nye Abram, si, Nkpuru-gi ka M'nyeworo ala nka, site n'osimiri Ijipt rue osimiri uku ahu, bú osimiri Yufretis: 19 ndi-Kinait, na ndi-Kenizait, na ndi-Kadmonait, 20 na ndi Het, na ndi-Perizait, na Refaim, 21 na ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi-Giagashait, na ndi Jebus.

Jenesis 16

1 Ma Serai, bú nwunye Abram, amughi nwa nye ya: ma ọ nwere otù nwayi nējere ya ozi, bú onye Ijipt, onye aha-ya bu Hega. 2 Serai we si Abram, Biko, le, Jehova eb͕ochiwom imu nwa; biko, bakuru nwayi nējerem ozi; eleghi anya agēsite na ya wuliem elu dika ulo. Abram we ge nti n'olu Serai. 3 Serai, bú nwunye Abram, we were Hega, bú onye Ijipt, bú nwayi nējere ya ozi, nye Abram, bú di-ya, na nwunye, n'ọgwugwu arọ nke-iri Abram biri n'ala Kenean. 4 O we bakuru Hega, o we turu ime: o we hu na ọ turu ime, ewe leda nwayi-nwe-ya n'anya-ya. 5 Serai we si Abram, Ihe-ikem di n'aru gi: mu onwem nyere nwayi nējerem ozi n'obi-gi; o we hu na ọ turu ime, ewe ledam n'anya-ya: ka Jehova kpe ikpe n'etiti mu na gi. 6 Abram we si Serai, Le, nwayi nējere gi ozi di n'aka-gi; me ya ihe di nma n'anya-gi. Serai we weda ya ala, o we b͕apu n'iru-ya. 7 Mọ-ozi nke Jehova we hu ya n'akuku isi-iyi miri ahu di n'ọzara, n'akuku isi-iyi ahu di n'uzọ Shua. 8 Ọ si, Hega, nwayi nējere Serai ozi, òle ebe i siri bia? ọ̀ bu kwa ole ebe i nēje? Ọ si, Ọ bu n'iru Serai, bú nwayi-nwem, ka m'nāb͕apu. 9 Mọ-ozi nke Jehova we si ya, Laghachikuru nwayi-nwe-gi, weda kwa onwe-gi ala n'okpuru aka-ya. 10 Mọ-ozi nke Jehova si kwa ya, M'gēme ka nkpuru-gi ba uba nke-uku, agaghi-aguta kwa ya n'ihi ọtutu ọ di. 11 Mọ-ozi nke Jehova si kwa ya, Le, gi onwe-gi di ime, i gaje imu nwa-nwoke; i gākpọ kwa aha-ya Ishmael, n'ihi na Jehova egewo nti na nweda-gi. 12 Ya onwe-ya gābu kwa madu yiri inyinya-ibu-ọhia; aka-ya gēmegide madu nile ọ bula, aka madu nile ọ bula gēmegide kwa ya; ọ bu kwa n'iru umu-nne-ya nile ka o gēbi. 13 Ọ we kpọ aha Jehova Nke nāgwa ya okwu, Gi onwe-gi bu Chineke nāhu uzọ: n'ihi na ọ siri, Ọ̀ bu kwa n'ebe a ka m'leworo azu Onye nāhum anya? 14 N'ihi nka ka akpọrọ ólùlù-miri ahu Bia-lahai-roi; le, ọ di n'etiti Kedesh na Bered. 15 Hega we muara Abram nwa-nwoke: Abram we kpọ aha nwa-ya nwoke, nke Hega muru, Ishmael. 16 Abram b͕ara ọgu arọ anọ na isi, mb͕e Hega muru Ishmael nye Abram.

Jenesis 17

1 Mb͕e Abram b͕ara ọgu arọ anọ na iri na iteghete, Jehova mere ka Abram hu Ya anya, Ọ si ya, Mu onwem bu Chineke Nke puru ime ihe nile; gi jegharia n'irum, buru kwa onye zuru okè. 2 M'gētiye kwa ọb͕ub͕a-ndum n'etiti Mu na gi, me ka i ba uba nke-uku nke-uku. 3 Abram we da kpu iru-ya n'ala: Chineke we kpayere ya uka, si, 4 Mu onwem, le, ọb͕ub͕a-ndum di n'ebe i nọ, i gāghọ kwa nna nke ìgwè mba. 5 Agaghi-akpọ kwa aha-gi Abram ọzọ, ma aha-gi gābu Abraham; n'ihi na nna nke ìgwè mba ka M'meworo gi. 6 M'gēme kwa ka i mua ọmùmù nke-uku nke-uku, M'gēme kwa ka i ghọ mba di iche iche, ndi-eze gēsi kwa nime gi puta. 7 M'gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n'etiti Mu na gi na nkpuru-gi, ndi gānọchi gi, rue ọb͕ọ-ha nile, ka ọ buru ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi, na M'gāburu gi, buru kwa nkpuru-gi, ndi gānọchi gi, Chineke. 8 M'gēnye kwa gi, nye kwa nkpuru-gi gānọchi gi, ala ọnọdu-ọbìa-gi nile, bú ala Kenean nile, ka ọ buru ihe-onwunwe ebighi-ebi; M'gābu-kwa-ra ha Chineke. 9 Chineke we si Abraham, Gi onwe-gi kwa, i gēdebe ọb͕ub͕a-ndum, gi onwe-gi, na nkpuru-gi, ndi gānọchi gi, rue ọb͕ọ-ha nile. 10 Nka bu ọb͕ub͕a-ndum, nke unu gēdebe, nke di n'etiti Mu na unu na nkpuru-gi, ndi gānọchi gi; agēbì nwa-nwoke ọ bula n'etiti unu úgwù. 11 Agēbì unu úgwù n'anu-aru nke apí-unu; ọ gābu kwa ihe-iriba-ama nke ọb͕ub͕a-ndu di n'etiti Mu na unu. 12 Agēbì onye ruru ubọchi asatọ úgwù n'etiti unu, nwa-nwoke ọ bula rue ọb͕ọ-unu nile, onye amuru n'ulo, na onye eji ego b͕ata n'aka onye ala ọzọ ọ bula, nke nēsighi na nkpuru-gi puta. 13 Aghaghi ibì onye amuru n'ulo-gi, na onye eji ego-gi b͕ata, úgwù: ọb͕ub͕a-ndum gādi kwa n'anu-aru-unu ka ọ buru ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi. 14 Ma nwoke anēbighi úgwù, nke anēbighi úgwù n'anu-aru nke apí-ya, agēbipu nkpuru-obi ahu n'etiti umu-nna-ya; ọ mebiwo ọb͕ub͕a-ndum. 15 Chineke we si Abraham, Serai, bú nwunye-gi, i gaghi-akpọ aha-ya Serai, n'ihi na Sera bu aha-ya. 16 M'gāgọzi ya, ọzọ kwa, M'gēnye gi nwa-nwoke site na ya: M'gāgọzi kwa ya, ọ gāghọ kwa mba di iche iche; ndi-eze nke ndi di iche iche gēsite na ya di. 17 Abraham we da kpue iru-ya n'ala, chì kwa ọchì, si n'obi-ya, Ọ̀ bu onye b͕ara ọgu arọ ise ka agā-muru nwa? Sera kwa, nke b͕ara ọgu arọ anọ na iri, ọ̀ gāmu nwa? 18 Abraham we si Chineke, Biko, ka Ishmael di ndu n'iru Gi! 19 Chineke we si, Kama, Sera, bú nwunye-gi, gaje imuru gi nwa-nwoke; i gākpọ aha-ya Aisak: M'gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n'ebe ọ nọ, ka ọ buru ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi nye nkpuru-ya gānọchi ya. 20 Ishmael kwa, anurum olu-gi bayere ya: le, agọziwom ya, M'gēme ka ọ mua ọmùmù, M'gēme kwa ka ọ ba uba nke-uku nke-uku; ndi-isi iri na abua ka ọ gāmu, M'gēme kwa ya ka ọ ghọ mba uku. 21 Ma ọb͕ub͕a-ndum ka M'gēme ka o guzosi ike n'ebe Aisak nọ, bú nke Sera gāmuru gi na mb͕e nka akara àkà gaeru. 22 Ọ we rapu ikpayere ya uka, Chineke we si n'ebe Abraham nọ rigo. 23 Abraham we chiri Ishmael, bú nwa-ya nwoke, na ndi nile amuru n'ulo-ya, na ndi nile eji ego-ya b͕ata, nwoke nile ọ bula n'etiti ndikom ulo Abraham, o bìe ha úgwù n'anu-aru nke apí-ha n'otù ubọchi ahu, dika Chineke kpayere ya uka. 24 Abraham b͕ara ọgu arọ anọ na iri na iteghete, mb͕e ebiri ya úgwù n'anu-aru nke apí-ya. 25 Ishmael, bú nwa-ya nwoke, b͕a-kwa-ra arọ iri na atọ, mb͕e ebiri ya úgwù n'anu-aru nke apí-ya. 26 N'otù ubọchi ahu ka ebiri Abraham na Ishmael nwa-ya nwoke úgwù. 27 Ọ bu kwa ya na ndikom ulo-ya nile, bú ndi amuru n'ulo, na ndi eji ego b͕ata n'aka ndi ala ọzọ, ka ebiri úgwù.

Jenesis 18

1 Jehova we me ka ọ hu Ya anya n'etiti osisi terebinth nke Mamre, mb͕e ya onwe-ya nānọdu n'ọnu-uzọ ulo-ikwū-ya n'ikpo-ọku nke ehihie; 2 o welie anya-ya abua elu, hu, ma, le, ndikom atọ nēguzo onwe-ha na ncherita-iru ya: mb͕e ọ huru ha, o si n'ọnu-uzọ ulo-ikwū ahu b͕a ọsọ izute ha, ọ kpọ isi ala, 3 si, Onye-nwem, biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru gi, biko, esila n'ebe orù-gi nọ gabiga: 4 biko, ka ekute nwantī miri, unu sa ukwu-unu, zuru-kwa-nu ike n'okpuru osisi a: 5 ka m'weta kwa iberibe achicha, nwe-kwa-nu ume n'obi-unu; emesia gabi-ganu: n'ihi na ọ bu n'ihi nka ka unu gabigakutere orù-unu. Ha we si, Me otú a, dika i kwuru. 6 Abraham we me ngwa ba n'ulo-ikwū-ya, bakuru Sera, si, Me ngwa, weta mb͕é utu ọka flour atọ, gwọ ya, me ob͕e achicha. 7 Abraham we b͕aga n'ìgwè ehi ya, were nwa-ehi nke anu-aru-ya nākaghi aka nke di kwa nma, nye okorọbia nējere ya ozi; o me ngwa idozi ya. 8 O were kwa miri-ara-ehi nke raru araru, na miri-ara-ehi, na nwa-ehi ahu nke o doziri, o che ha n'iru ha; ya onwe-ya we nēguzo n'akuku ha n'okpuru osisi ahu, ha we rie. 9 Ha si ya, Òle ebe Sera, bú nwunye-gi, nọ? Ọ si, Le, ọ nọ n'ulo-ikwū. 10 Ọ si, Aghaghim ichigharikute gi dika mb͕e a n'arọ ọzọ; le kwa, Sera, bú nwunye-gi, gēnwe nwa-nwoke. Ma Sera nuru n'ọnu-uzọ ulo-ikwū, nke di n'azu ya. 11 Ma Abraham na Sera ghọrọ agadi, ubọchi ndu-ha nāgwu; ọ ghawori idiri Sera dika ọ nādiri ndinyom. 12 Sera we chì ọchì nime onwe-ya, si, M'gēnwe ihe-utọ mb͕e m'kasiri nká, onye-nwem bu kwa agadi? 13 Jehova we si Abraham, Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka Sera chiworo ọchì, si, Ọ̀ gābu ezi-okwu na m'gāmu nwa, mb͕e mu onwem ghọworo agadi? 14 Ọ̀ di ihe kariri Jehova ime? Na mb͕e akara àkà ka M'gēchigharikute gi, dika mb͕e a aka-nile, Sera gēnwe kwa nwa-nwoke. 15 Sera we gọ, si, Achighm ọchì; n'ihi na ọ nātu egwù. Ọ si, É-è; kama i chiri ọchì. 16 Ndikom ahu we si n'ebe ahu bilie, le anya n'ebe Sọdọm di: Abraham nēso kwa ha je idupu ha. 17 Jehova we si, Mu onwem, M'nēzonari Abraham ihe Mu onwem nēme; 18 ebe Abraham nāghaghi ighọ mba di uku nwe kwa ume, agāgọzi kwa mba nile nke uwa nime ya? 19 N'ihi na amawom ya, ka o we nye umu-ya na ulo-ya, ndi gānọchi ya, iwu, ka ha we debe uzọ Jehova, ime ezi omume na ihe ekpere n'ikpe; ka Jehova we weta n'isi Abraham ihe O kwuru bayere ya. 20 Jehova we si, Iti-nkpu Sọdọm na Gọmọra, o riri nne n'ezie, nmehie-ha kwa, ọ di arọ́ nke-uku n'ezie; 21 ka M'rida kwa, hu ma ọ bu dika iti-nkpu ya si di, nke rurum nti, ka ha mezuworo; ọ buru kwa na ọ dighi otú a, ka M'mara. 22 Ndikom ahu we si n'ebe ahu che iru je n'uzọ Sọdọm: ma Abraham nēguzogide n'iru Jehova. 23 Abraham we biarue nso, si, Ọ̀ gābu ezie na I gēkpochapu ndi ezi omume tinyere ndi nēmebi iwu? 24 Eleghi anya ọgu ndi ezi omume abua na iri di n'obodo ahu: ọ̀ gābu ezie na i gēkpochapu ebe ahu ghara ib͕aghara ya n'ihi ọgu ndi ezi omume abua na iri nọ nime ya? 25 Ya buru Gi ihe-árú ime dika ihe a si di, ime ka onye ezi omume so onye nēmebi iwu nwua, o we buru na dika ndi ezi omume si di, otú a ka ndi nēmebi iwu di; ya buru Gi ihe-árú: Onye-ikpé uwa nile, Ọ̀ gaghi-eme ihe ekpere n'ikpe? 26 Jehova we si, Ọ buru na achọtam nime Sọdọm ọgu ndi ezi omume abua na iri n'etiti obodo ahu, M'gāb͕aghara ebe ahu nile n'ihi ha. 27 Abraham we za, si, Biko, le, ejisiwom ike igwa Onye-nwe-ayi okwu, mu onwem, nke bu ájá na ntu: 28 eleghi anya madu ise agaghi-adi n'ọgu ndi ezi omume abua na iri ahu: Ì gēbibi obodo ahu nile n'ihi madu ise ahu nādighi ya? Ọ si, M'gaghi-ebibi ya, ma M'chọta n'ebe ahu ọgu abua na ise. 29 Ọ gwa kwa Ya okwu ọzọ, si, Eleghi anya agāchọta n'ebe ahu ọgu abua. Ọ si, M'gaghi-eme ya n'ihi ọgu abua ahu. 30 Ọ si, Biko, ka Onye-nwe-ayi ghara iwe iwe di ọku, ka m'kwu kwa okwu: eleghi anya agāchọta n'ebe ahu orú na iri. Ọ si, M'gaghi-eme ya, ma M'chọta n'ebe ahu orú na iri. 31 Ọ si, Biko, le, ejisiwom ike igwa Onye-nwe-ayi okwu: eleghi anya agāchọta n'ebe ahu orú. Ọ si, M'gaghi-ebibi ya n'ihi orú ahu. 32 Ọ si, Biko, ka Onye-nwe-ayi ghara iwe iwe di ọku, ka m'kwu kwa okwu nání otù ub͕ò a: eleghi anya agāchọta n'ebe ahu iri. Ọ si, M'gaghi-ebibi ya n'ihi iri ahu. 33 Jehova we la, mb͕e Ọ gwabisiri Abraham okwu: Abraham we lata n'ọnọdu-ya.

Jenesis 19

1 Abua nime ndi-mọ-ozi ahu we biarue Sọdọm n'anyasi; ma Lot nānọdu n'ọnu-uzọ-ama Sọdọm: Lot we hu ha anya, bilie izute ha, ọ da kpue iru-ya n'ala, 2 si, Biko, le, ndi-nwem, biko, sinu n'ije-unu wezuga onwe-unu bà n'ulo orù-unu, nọ ọnọdu-abali, sa kwa ukwu-unu, unu gēbili n'isi-ututu, la, Ha si, É-è, kama ọ bu n'amá ka ayi gānọ ọnọdu-abali. 3 O rugide ha nke-uku; ha we si n'ije-ha wezuga onwe-ha jekuru ya, ba n'ulo-ya; O we mere ha oké oriri, sie achicha ekoghi-eko, ha rie. 4 Ma tutu ha edina, ndikom obodo ahu, bú ndikom Sọdọm, b͕ara ulo ahu buru-buru, ma okorọbia ma agadi, ndi ala ahu nile site n'akuku ọ bula; 5 ha we kpọ Lot òkù, si ya, Òle ebe ha nọ, bú ndikom ndi bakutere gi n'abali a? me ka ha putakute ayi, ka ayi we mara aru-ha. 6 Lot we pukuru ha rue ọnu-uzọ, mechie uzọ n'azu ya. 7 Ọ si, Biko, umu-nnem, unu emela ihe ọjọ. 8 Biko, le, enwerem umu-ndinyom abua ndi akāmaghi aru nwoke: biko, ka m'kuputara unu ha, me-kwa-nu ha dika ọ di nma n'anya-unu: nání unu emela ndikom ahu ihe; n'ihi na ọ bu n'ihi nka ka ha biara n'okpuru ndò nke ulom. 9 Ha si, Pua n'uzọ. Ha si kwa, Otù onye a batara inọ dika ọbia, ọ we nēkpe ikpe nke ukwu: ub͕u a ayi gēme gi ihe kari ihe ayi gēme ha. Ha we rugide nwoke ahu, bú Lot, nke-uku, biarue nso itiwa ibo-uzọ. 10 Ndikom ahu we setipu aka-ha, me ka Lot bakute ha n'ulo, ha we mechie uzọ. 11 Ha we were ikpu-ìsì tie ndikom ahu ndi nọ n'ọnu-uzọ ulo, ma onye ntà ma onye uku: ike we gwu ha ichọta ọnu-uzọ ahu. 12 Ndikom ahu we si Lot, Ọ̀ di onye i nwere n'ebe a ọzọ? di nwa-gi, na umu-gi ndikom, na umu-gi ndinyom, na onye ọ bula i nwere n'obodo a; me ka ha si n'ebe a pua: 13 n'ihi na ndi nēbibi ebe a ka ayi bu, n'ihi na iti-nkpu-ha aghọwo ihe uku n'iru Jehova; Jehova ezitewo kwa ayi ibibi ya. 14 Lot we pua, gwa di umu-ya, ndi nālu umu-ya ndinyom, okwu, si, Bilienu, si n'ebe a pua; n'ihi na Jehova nēbibi obodo a. Ma ọ di ka onye nākwa emò n'anya di umu-ya. 15 Ma mb͕e chi bọrọ, ndi-mọ-ozi ahu nukpọrọ Lot, si, Bilie, chiri nwunye-gi, na umu-gi ndinyom abua ndi ahuru n'ebe a; ka ewe ghara ikpochapu gi n'ahuhu ajọ omume obodo a. 16 Ma ọ b͕agwojuru ya anya; ndikom ahu we jide aka-ya, jide kwa aka nwunye-ya, jide kwa aka umu-ya ndinyom abua; n'ihi na Jehova nwere ọmiko n'aru ya: ha we me ka ọ puta, me ka ọ nọdu n'azu obodo. 17 O rue, mb͕e ha mesiri ka ha puta n'azu obodo, na ọ siri, Wepuga onwe-gi n'ihi ndu-gi; elekwala anya n'azu gi, eguzokwala na Gburugburu-ala a nile; wepuga onwe-gi je ugwu ahu, ka ewe ghara ikpochapu gi. 18 Lot we si ha, É-è, biko, onye-nwem: 19 biko, le, orù-gi ahutawo amara n'iru gi, i mewo kwa ka ebere-gi di uku, nke i meworom n'idebem ndu; mu onwem apughi kwa iwepuga onwem je ugwu, ka ihe ọjọ ahu we ghara irapara n'arum, m'we nwua: 20 biko, le, obodo a di nso ib͕alaga n'ebe ahu, nke ahu bu kwa obodo ntà: biko, ka m'wepuga onwem je ebe ahu, (ọ̀ bughi obodo ntà? ) nkpuru-obim gādi kwa ndu. 21 Ọ si ya, Le, m'huwo kwa gi iru-ọma n'okwu a, na m'gaghi-akwatu obodo a nke i kwuworo okwu bayere ya. 22 Me ngwa, wepuga onwe-gi je ebe ahu; n'ihi na apughm ime ihe rue mb͕e i gābà n'ebe ahu. N'ihi nka ka akpọrọ aha obodo ahu Zoa. 23 Anyanwu awawo n'elu uwa mb͕e Lot batara nime Zoa. 24 Jehova we me ka brimstone na ọku si n'elu-igwe zokwasi Sọdọm na Gọmọra dika miri site n'ebe Jehova nọ; 25 O we kwatue obodo ndia, na Buruburu-ala ahu nile, na ndi nile bi n'obodo ahu nile, na ihe-opupú nke ala. 26 Ma nwunye-ya siri n'azu Lot leghachi anya n'azu, we ghọ ogidi nnú. 27 Abraham we bilie n'isi-ututu je ebe ahu nke o guzorori n'iru Jehova: 28 ọ le anya n'ebe Sọdọm na Gọmọra di, na n'ebe ala nile nke Buruburu-ala ahu di, ọ we hu, ma, le, anwuru-ọku nke ala ahu rigoro dika anwuru-ọku nke oké ọku. 29 O rue, mb͕e Chineke bibiri obodo nile nke Buruburu-ala ahu, na Chineke chetara Abraham, we si n'etiti nkwatu ahu zipu Lot, mb͕e Ọ kwaturu obodo nke Lot biri nime ha. 30 Lot we si na Zoa rigo, biri n'ugwu ahu, ya na umu-ya ndinyom abua; n'ihi na ọ turu egwu ibi nime Zoa: ọ we biri n'ọb͕à, ya onwe-ya na umu-ya ndinyom abua. 31 Ada we si nke-ntà, Nna-ayi aghọwo agadi, ma ọ dighi nwoke n'uwa ibakute ayi, dika uzọ uwa nile si di: 32 bia, ka ayi me nna-ayi ka ọ ṅua manya-vine, ka ayi na ya dina kwa, ka ayi we site na nna-ayi debe nkpuru ndu. 33 Ha we me ka nna-ha ṅua manya-vine n'abali ahu: ada we ba, ya na nna-ya we dina; ma nna-ya amaghi mb͕e o dinara, na mb͕e o biliri. 34 O rue n'echi-ya, na ada siri nke-ntà, Le, mu na nnam dinara n'abali nyahuru: ka ayi me ka ọ ṅu kwa manya-vine n'abali a; gi ba kwa, gi na ya dina, ka ayi we site na nna-ayi debe nkpuru ndu. 35 Ha we me ka nna-ha ṅu kwa manya-vine n'abali ahu: nke-ntà we bilie, ya na nna-ya we dina; ma nna-ya amaghi mb͕e o dinara, na mb͕e o biliri. 36 Umu Lot ndinyom abua we turu ime site n'aka nna-ha. 37 Ada we mua nwa-nwoke, kpọ aha-ya Moab: onye ahu bu nna ndi Moab rue ta. 38 Nke-ntà kwa, ya onwe-ya mu-kwa-ra nwa-nwoke, kpọ aha-ya Ben-ami: onye ahu bu nna umu Amon rue ta.

Jenesis 20

1 Abraham we si n'ebe ahu bulie ije n'uzọ ala Negeb, biri n'etiti Kedesh na Shua; ọ we nọ dika ọbìa nime Gera. 2 Abraham we kwue okwu bayere Sera, bú nwunye-ya, si, Nwa-nnem nwayi ka ọ bu: Abimelek, bú eze Gera, we zìe ozi, kuru Sera. 3 Ma Chineke biakutere Abimelek na nrọ nke abali, si ya, Le, gi bu onye nwuru anwu, n'ihi nwayi ahu nke i kuruworo; n'ihi na nwayi ahu bu nwunye di luru. 4 Ma Abimelek akābiaghi nso ya: ọ we si, Onye-nwe-ayi, Ọ̀ bu kwa mba nke nēme ezi omume ka I gēb͕u? 5 Ọ̀ bughi nwoke ahu sirim, Nwa-nnem nwayi ka ọ bu? nwayi ahu kwa, ọbuná ya onwe-ya siri, Nwa-nnem nwoke ka ọ bu: n'izu-okè nke obim na n'emeghi-ihe-ọjọ nke ọbu-akam abua ka m'meworo nka. 6 Chineke we si ya nime nrọ ahu, Mu onwem kwa, amawom na ọ bu n'izu-okè nke obi-gi ka i meworo nka, Mu onwem we b͕ochi kwa gi ka i ghara ime-hie megidem: n'ihi ya ekweghm i metu ya aka. 7 Ma ub͕u a me ka nwunye nwoke ahu laghachi; n'ihi na onye-amuma ka ọ bu, ọ gēkpe kwa ekpere bayere gi, i we di ndu: ma ọ buru na i meghi ka ọ laghachi, gi mata na i ghaghi inwu anwu, gi onwe gi, n'ihe nile inwere. 8 Abimelek we bilie n'isi-ututu, kpọ ndi-orù-ya nile, kwue okwu ndia nile na nti-ha: ndikom ahu we tua egwu nke-uku. 9 Abimelek we kpọ Abraham, si ya, Gini bu ihe i meworo ayi? gini bu kwa ihe m'mehie-woro megide gi, na i mewo ka nmehie uku biakwasim, biakwasi kwa ala-ezem? omume nke nēkwesighi ime ka imeworo m. 10 Abimelek si kwa Abraham, Gini ka i huru, na i mewo ihe a? 11 Abraham we si, N'ihi na asirim, N'ezie ọ dighi egwù Chineke di n'ebe a; ha gēb͕ukwam n'ihi okwu bayere nwunyem. 12 Ọzọ kwa, ọ bu nwa-nnem nwayi n'ezie, nwa-nwayi nnam ka ọ bu, ọ bu nání na ọ bughi nwa-nwayi nnem; ọ we ghọrọm nwunye: 13 o rue, mb͕e Chineke merem ka m'si n'ulo nnam waghari, na asirim ya, Nka bu ebere-gi nke i gēmerem; n'ebe nile ọ bula nke ayi gābiaru ebe ahu, gi kwue okwu bayerem, si, Nwa-nnem nwoke ka ọ bu. 14 Abimelek we chiri ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, na orù-ndikom na ndinyom nēje ozi, nye Abraham, me kwa ka Sera nwunye-ya laghachikute ya. 15 Abimelek we si, Le, alam di n'iru gi: biri n'ebe di nma n'anya-gi. 16 Ọ si Sera, Le, enyewom nwa-nne-gi nnù nkpuru-ego ọla-ọcha abua na ọgu iri: le, nke ahu buru gi ihe-nkpuchi anya n'ebe ndi nile nọ, bú ndi gi na ha nọ; ọ bu kwa n'iru madu nile ka emeziworo gi. 17 Abraham we kpere Chineke: Chineke we me ka aru di Abimelek na nwunye-ya na orù-ya ndinyom nma; ha we mua umu. 18 N'ihi na Jehova b͕ochisiri àkpà-nwa nile nke ulo Abimelek ike, n'ihi okwu bayere Sera, bú nwunye Abraham.

Jenesis 21

1 Jehova we leta Sera dika Ọ siri, Jehova we me Sera dika O kwuru. 2 Sera we turu ime, muara Abraham nwa-nwoke n'agadi-ya, na mb͕e ahu akara àkà nke Chineke kpayere Abraham uka bayere ya. 3 Abraham we kpọ aha nwa-ya nwoke nke amuru nye ya, onye Sera muru nye ya, Aisak. 4 Abraham we bìe nwa-ya nwoke, bú Aisak, úgwù mb͕e o ruru ubọchi asatọ, dika Jehova nyere ya iwu. 5 Abraham b͕ara ọgu arọ ise, mb͕e amuru ya Aisak, bú nwa-ya nwoke. 6 Sera we si, Ichì-ọchì ka Chineke doziworom; onye ọ bula nke nānu ya gāchì ọchì bayerem. 7 Ọ si kwa, Ònye gāsiwori Abraham, Sera gēnye umu ara? n'ihi na amuworom ya nwa-nwoke n'agadi-ya. 8 Nwa ahu we tó etó, eme ka ọ rapu ara: Abraham we me oké oriri di uku n'ubọchi emere ka Aisak rapu ara. 9 Sera we hu nwa-nwoke Hega, bú nwayi Ijipt, nke ọ mururi Abraham, ka ọ nāchì ọchì nke-uku. 10 Ọ we si Abraham, Chupu orù-nwayi a na nwa-ya nwoke: n'ihi na nwa-nwoke orù-nwayi a agaghi-eso nwam nwoke, bú Aisak, nweta ihe-gi. 11 Ma ihe ahu jọrọ njọ nke-uku n'anya Abraham n'ihi nwa-ya nwoke. 12 Chineke we si Abraham, Ka ọ ghara ijọ njọ n'anya-gi n'ihi nwa-okoro a, na n'ihi orù-gi nwayi: ihe nile Sera nāsi gi me, ge nti n'olu-ya; n'ihi na ọ bu nime Aisak ka agākpọrọ gi nkpuru. 13 Ọzọ kwa, nwa orù-nwayi ahu ka M'gēme ka ọ ghọ mba, n'ihi na nkpuru-gi ka ọ bu. 14 Abraham we bilie n'isi-ututu, were achicha na karama-akpukpọ miri nye Hega, tukwasi ya n'ubu-ya, ọ nye kwa ya nwa-ya, zilaga ya: ọ we je, nāwaghari n'ọzara Bia-sheba. 15 Miri we gwu na karama-akpukpọ ahu, ọ we tuda nwa ahu n'okpuru otù nime osisi ntà, 16 je, nọdu ala n'onwe-ya na ncherita-iru ya n'ebe di anya, dika ndi nāb͕a uta gāb͕aru; n'ihi na ọ siri, Ka m'ghara ilekwasi ọnwu nwam anya. Ọ we nọdu na ncherita-iru ya, welie olu-ya, kwa ákwá. 17 Chineke we nu olu nwa-okoro ahu; mọ-ozi nke Chineke we si n'elu-igwe kpọ Hega òkù, si ya, Gini nēme gi, Hega? atula egwu; n'ihi na Chineke anuwo olu nwa-okoro ahu n'ebe ọ nọ. 18 Bilie, palie nwa-okoro ahu, jide ya n'aka-gi; n'ihi na mba uku ka M'gēme ya ka ọ ghọ. 19 Chineke we meghe anya-ya abua, ọ hu olùlù-miri; ọ we je, b͕ajue karama-akpukpọ-ya na miri, me ka nwa-okoro ahu ṅua. 20 Chineke we nọyere nwa-okoro ahu, ọ we tó etó, biri n'ọzara, ghọ ọ̀kà-uta, ka o nētó etó. 21 O biri n'ọzara Peran: nne-ya we si n'ala Ijipt lutara ya nwunye. 22 O rue na mb͕e ahu, na Abimelek na Faikol, bú onye-isi usu-ndi-agha-ya, gwara Abraham okwu, si, Chineke nọyere gi n'ihe nile nke gi onwe-gi nēme: 23 ma ub͕u a were Chineke ṅuaram iyi n'ebe a na i gaghi-agwa mu onwem, ma-ọbu umum, ma-ọbu umu umum, okwu-ugha: ọ bu dika ebere nke m'meworo gi si di ka i gēmerem, mekwaram ala nke i nọworo dika ọbìa nime ya. 24 Abraham we si, Mu onwem gāṅu iyi. 25 Abraham we bara Abi-melek mba n'ihi olùlù-miri nke ndi-orù Abimelek napuru ya-ri n'ike. 26 Abi-melek we si, Amaghm onye mere ihe a: ọzọ kwa, gi onwe-gi, i gosighm, ma mu onwem kwa, anughm ya, ma-ọbughi nání taa. 27 Abraham we chiri ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi nye Abimelek; ha abua we b͕a ndu. 28 Abraham we debe umu-nne-aturu asa n'onwe-ha iche, bú nke ìgwè ewu na aturu. 29 Abimelek we si Abraham, Gini ka umu-nne-aturu asa ndia nke i debere n'onwe-ha iche bu? 30 Ọ we si, Umu-nne-aturu asa ndia ka i gānara n'akam, ka ọ we ghọrọm ihe-àmà na m'gwuru olùlù-miri a. 31 N'ihi ya ọ kpọrọ ebe ahu Bia-sheba; n'ihi na n'ebe ahu ka ha abua ṅuru iyi. 32 Ha we b͕a ndu na Bia-sheba: Abimelek we bilie, ya na Faikol, bú onye-isi usu-ndi-agha-ya, ha laghachi n'ala ndi Filistia. 33 Abraham we kua osisi tamarisk na Bia-sheba, kpọkue aha Jehova, bú Chineke Ebighi-ebi, n'ebe ahu. 34 Abraham we nọ dika ọbìa n'ala ndi Filistia ọtutu ubọchi.

Jenesis 22

1 O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na Chineke nwara Abraham, si ya, Abraham; ọ si, Lekwam. 2 Ọ si, Biko, were nwa-gi nwoke nke i nwere nání ya, onye i huru n'anya, bú Aisak, je ala Moraia; sure ya n'ebe ahu, ka ọ buru àjà-nsure-ọku, n'elu otù nime ugwu ahu nke M'gāsi gi je. 3 Abraham we bilie n'isi-ututu, jikwa inyinya-ibu-ya, chiri madu abua nime umu-okorọbia-ya tiyere onwe-ya, na Aisak, bú nwa-ya nwoke; ọ kpọwa nkú nke àjà-nsure-ọku, bilie, je ebe ahu nke Chineke siri ya-ri je. 4 N'ubọchi nke-atọ Abraham weliri anya-ya abua, hu ebe ahu n'ebe di anya. 5 Abraham we si umu-okorọbia-ya, Nọdunu ebe a n'onwe-unu, unu na inyinya-ibu, ma mu onwem na nwa-okoro a gēje ebe ahu; ayi gākpọ kwa isi ala, chigharikute unu. 6 Abraham we were nkú àjà-nsure-ọku, bo Aisak nwa-ya nwoke; o jide n'aka-ya ọku na mma; ha abua we yikọ je. 7 Aisak we gwa Abraham, bú nna-ya, okwu, si, Nnam; ọ si, Lekwam, nwam. Ọ si, Le, ọku na nkú: ma òle ebe nwa-aturu iji chu aja-nsure-ọku di? 8 Abraham we si, Chineke gāhuru Onwe-ya nwa-aturu iji chu aja-nsure-ọku, nwam: ha abua we yikọ je. 9 Ha biarue ebe ahu nke Chineke siri ya-ri je; Abraham we wue ebe-ichu-aja n'ebe ahu, do nkú ahu n'usoro, ke Aisak, bú nwa-ya nwoke, ab͕ú, tukwasi ya n'elu ebe-ichu-àjà, n'elu nku. 10 Abraham we setia aka-ya, were mma ahu ib͕u nwa-ya nwoke. 11 Ma mọ-ozi nke Jehova siri n'elu-igwe kpọ ya òkù, si, Abraham, Abraham: ọ si, Lekwam. 12 Ọ si, Esetila aka-gi tukwasi n'aru nwa-okoro ahu, eme-kwa-la ya ihe ọ bula: n'ihi na ub͕u a ka M'mara na onye nātu egwu Chineke ka i bu, n'ihi na i b͕ochighi nwa-gi nwoke, nke i nwere nání ya, iwere ya nyem. 13 Abraham we welie anya-ya abua hu, ma, le, otù ebulu n'azu ya, nke alughi-ulù nējide ya na mpi-ya: Abraham we je, were ebulu ahu, sure ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku n'ọnọdu nwa-ya nwoke. 14 Abraham we kpọ aha ebe ahu Jehova-Jaire: dika anāsi rue taa, N'ugwu nke Jehova ka agāhu ya. 15 Mọ-ozi nke Jehova we si n'elu-igwe kpọ Abraham òkù nke ub͕ò abua, 16 si, Ejim Onwem ṅu iyi, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, na n'ihi na i mewo ihe a, n'ihi na i b͕ochighi kwa nwa-gi nwoke, onye i nwere nání ya: 17 na n'igọzi M'gāgọzi gi, n'ime ka aba uba M'gēme kwa ka nkpuru-gi ba uba dika kpakpando nke elu-igwe, na dika ájá nke di n'usọ oké osimiri; nkpuru-gi gēnweta kwa ọnu-uzọ-ama nke ndiroya; 18 ọ bu kwa na nkpuru-gi ka mba nile nke uwa gāgọzi onwe-ha; n'ihi na i gewo nti n'olum. 19 Abraham we chigharikute umu-okorọbia-ya, ha bilie, yikọ je Bia-sheba; Abraham we biri na Bia-sheba. 20 O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na egosiri Abraham, si, Le, Milka, ya onwe-ya amuwo-kwa-ra nwa-nne-gi nwoke, bú Nehoa, umu-ndikom; 21 Uz, bú ọkpara-ya, na Buz, bú nwa-nne-ya, na Kemuel, bú nna Eram 22 na Kesed, na Hazo, na Pildash, na Jidlaf, na Betuel. 23 Betuel we mua Rebeka: madu asatọ ndia ka Milka muru nye Nehoa, bú nwa-nne Abraham. 24 Iko-ya nwayi, onye aha-ya bu Reuma, ya onwe-ya mu-kwa-ra Tiba, na Gaham, na Tahash, na Meaka.

Jenesis 23

1 Ndu Sera we buru ọgu arọ isi na asa: ndia bu arọ ndu Sera. 2 Sera we nwua na Kiriat-aba (nke ahu bu Hebron), n'ala Kenean: Abraham we bia itiri Sera aka n'obi, na ikwara ya ákwá. 3 Abraham we si n'iru onye nke ya nwuru anwu bilie, gwa umu Het okwu, si, 4 Ọbìa na onye-nnọdu ka m'bu n'etiti unu: nyenum ihe-onwunwe, bú ala-ílì, n'etiti unu, ka m'we lìpu ya n'anyam, bú onye-nkem nwuru anwu. 5 Umu Het we za Abraham, si ya, 6 Nuru olu-ayi, onye-nwem: onye-isi nke Chineke ka i bu n'etiti ayi: lìe onye-nke-gi nwuru anwu n'ílì ahu nke kachasi nma n'ílì-ayi nile; ọ dighi onye nime ayi gēb͕ochiri gi ílì-ya ka i ghara ilì onye-nke-gi nwuru anwu 7 Abraham we bilie, kpọ isi ala nye ndi ala ahu, bú umu Het. 8 Ọ we kpayere ha uka, si, Ọ buru na ọ di na nkpuru-obi-unu ilìpu ya n'anyam, bú onye-nkem nwuru anwu, nurunu olum, riọkwara m Efron nwa Zoha, 9 ka ọ we nyem ọb͕à Makpila, nke ọ nwere, nke di n'isi nke ọhia-ya n'ego zuru ezu o ruru ka ọ gēnyem ya n'etiti unu ka ọ buru ihe-onwunwe, nke gābu ala-ílì. 10 Ma Efron nānọdu n'etiti umu Het: Efron onye Het we za Abraham na nti umu Het, bú ndi nile nābà n'ọnu-uzọ-ama obodo-ya, si, 11 E-è, onye-nwem, nuru olum: ọhia ahu ka m'nyeworo gi, na ọb͕à ahu nke di nime ya, gi ka m'nye-woro ya; n'anya umu ndi nkem ka m'nyeworo gi ya: lìe onye-nke-gi nwuru anwu. 12 Abraham we kpọ isi ala n'iru ndi ala ahu. 13 Ọ gwa Efron okwu na nti ndi ala ahu, si, Kama, ọ buru na gi onwe-gi kwere, biko, nuru olum: enyewom ego ọhia ahu; naram ya, ka m'we lìe onye-nkem nwuru anwu n'ebe ahu. 14 Efron we za Abraham, si ya, 15 Onye-nwem, nuru olum: ala nke ruru nnù shekel ọla-ọcha, ǹke ahu bu gini n'etiti mu na gi? lì kwa onye-nke-gi nwuru anwu. 16 Abraham we ge Efron nti; Abraham we tùara Efron ọla-ọcha ahu, nke o kwuru na nti umu Het, nnù shekel ọla-ọcha nke ndi-ahia gānara. 17 Ọhia Efron, nke di nime Makpila, nke di n'iru Mamre, ọhia ahu, na ọb͕à ahu nke di nime ya, na osisi nile nke di n'ọhia ahu, nke di n'ókè-ala ya nile gburugburu, ewe me ha ka ha guzosiere Abraham ike 18 ibu ihe-nzuta n'anya umu Het, n'etiti ndi nile nābà n'ọnu-uzọ-ama obodo-ya. 19 Emesia Abraham lìri Sera, bú nwunye-ya, n'ọb͕à ọhia Makpila ahu n'iru Mamre (nke ahu bu Hebron), n'ala Kenean. 20 Umu Het we me ọhia ahu na ọb͕à nke di nime ya ka ha guzosiere Abraham ike ibu ihe-onwunwe nke gābu ala-ílì.

Jenesis 24

1 Ma Abraham ghọrọ agadi, ubochi nduya nāgwu: Jehova gọzikwarari Abraham n'ihe nile. 2 Abraham we si orù-ya, bú okenye nke ulo-ya, onye nāchi ihe nile o nwere, Biko, tiye aka-gi n'okpuru apata-ukwum: 3 m'gēme kwa gi ka i were Jehova, bú Chineke nke elu-igwe na Chineke nke uwa, ṅu iyi, na i gaghi-alutara nwam nwunye sitere n'umu-ndinyom nke ndi Kenean, ndi mu onwem bi n'etiti ha: 4 kama ọ bu alam na umu-nnam ka i gējekuru, lutara nwam, bú Aisak, nwunye. 5 Orù ahu we si ya, Eleghi anya nwayi ahu agaghi-achọ isom jerue ala nka: ọ̀ bu na m'nāghaghi ime ka nwa-gi laghachi n'ala ahu nke i siri n'ebe ahu puta? 6 Abraham we si ya, Lezie onwe-gi anya ka i ghara ime ka nwam laghachi n'ebe ahu. 7 Jehova, bú Chineke nke elu-igwe, Nke si n'ulo nnam, na n'ala amurum, kuputam, Nke gwakwara m okwu, Nke ṅukwara m iyi, si, Nkpuru-gi ka M'gēnye ala nka; Ya onwe-ya gēziga mọ-ozi-Ya n'iru gi, i gēsi kwa n'ebe ahu lutara nwam nwunye. 8 Ma ọ buru na nwayi ahu achọghi iso gi je, ya bu i puwo n'iyi nka i ṅurum; nání na i gaghi-eme ka nwam laghachi n'ebe ahu. 9 Orù ahu we tiye aka-ya n'okpuru apata-ukwu Abraham onye-nwe-ya, ṅuara ya iyi bayere okwu a. 10 Orù ahu we chiri kamel iri, nime kamel nile nke onye-nwe-ya, je; ezi ihe nile nke onye-nwe-ya di kwa n'aka-ya: o bilie, je Mesọpọtemia, rue obodo Nehoa. 11 Ọ me ka camel nile b͕ue ikpere n'ala n'azu obodo ahu n'akuku olùlù-miri na mb͕e anyasi, na mb͕e ndinyom ndi nēsere miri nāputa. 12 Ọ si, Jehova, bú Chineke nke onye-nwem Abraham, biko, me ka o zutem taa, bú ihe m'nāchọ, mekwara onye-nwem Abraham ebere. 13 Le, mu onwem nēguzo n'akuku isi-iyi miri a; umu-ndinyom nke ndi obodo a nāputa kwa isere miri: 14 ka o ru kwa, na nwa-ab͕ọghọ ahu onye m'gāsi, Biko, zie ite-gi ka m'ṅua; onye gāsi kwa, Ṅua, ọzọ kwa, camel-gi ka m'gēme ka ha ṅua: ka ọ buru nwayi ahu ka I rọputaworo nye orù-gi, bú Aisak; ọ bu kwa nime nka ka m'gāmara na I meworo onye-nwem ebere. 15 O rue na, tutu o kwusia okwu, le, Rebeka nāputa, bú nwayi amuru nye Betuel nwa-nwoke Milka, bú nwunye Nehoa, nwa-nne Abraham, ite-ya di kwa n'ubu-ya. 16 Nwa-ab͕ọghọ ahu di nma nke-uku ile anya, nwayi nke akāmaghi nwoke, nwoke amaghi kwa aru-ya: ọ rida n'isi-iyi ahu, b͕ajue ite-ya, rigota. 17 Orù ahu we b͕a ọsọ izute ya, si, Biko, kwe ka m'ṅua nwantī miri site n'ite-gi. 18 Ọ si, Nua, onye-nwem: ọ me ngwa, zie ite-ya n'aka-ya, me ka ọ ṅua. 19 Mb͕e ọ mesiri ka ọ ṅua, nwayi ahu siri, Kamel gi ka m'gēsere kwa miri, rue mb͕e ha gāṅujuwori. 20 Ọ me ngwa, b͕apu miri di n'ite-ya nime ihe anu-ulo ji aṅu miri, ọ b͕a ọsọ ọzọ rue olùlù-miri isere miri, we sere nye camel-ya nile. 21 Nwoke ahu nēlegide ya anya, nāb͕a nkiti, imara ma Jehova mereri ka ije-ya ga nke-ọma, ma-ọbu na O meghi. 22 O rue, mb͕e camel ṅujusiri miri, na nwoke ahu were nb͕a-aka ọla-edo, nke ọtùtù-ya bu nkera shekel, na ọla-aka abua ib͕a n'aka-ya abua nke ọtùtù-ha bu shekel ọla-edo iri; 23 ọ si, Ǹwa onye ka i bu? biko, gosim. Ọ̀ di ọnọdu n'ulo nna-gi ayi gēnwe inọ ọnọdu-abali? 24 Nwayi ahu we si ya, Nwa Betuel ka m'bu, bú nwa Milka, nke ọ muru nye Nehoa. 25 Ọ sikwara ya, Ma okporo-ọka ma nri-anu-ulo riri nne n'ulo-ayi, ebe inọ ọnọdu-abali di kwa. 26 Nwoke ahu we rube isi, kpọ isi ala nye Jehova, 27 si, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke nke onye-nwem Abraham, bu, Onye nārapughi ebere-Ya na ezi-okwu-Ya n'ebe onye-nwem nọ: mu onwem, n'uzọ ka Jehova duworom rue ulo umu-nne onye-nwem. 28 Nwa-ab͕ọghọ ahu we b͕a ọsọ, gosi ulo nne-ya dika okwu ndia si di. 29 Ma Rebeka nwere nwa-nne nwoke, nke aha-ya bu Leban: Leban we b͕akuru nwoke ahu n'èzí, rue isi-iyi ahu. 30 O rue, mb͕e ọ huru nb͕a-aka ahu, na ọla-aka abua di n'aka nwa-nne-ya nwayi, mb͕e ọ nukwara okwu nile nke Rebeka nwa-nne-ya nwayi, si, Otú a ka nwoke ahu gwaram; na o biakutere nwoke ahu; ma, le, o nēguzo n'akuku camel-ya n'akuku isi-iyi ahu. 31 O we si, Bata, gi onye agọziri agọzi nke Jehova; n'ìhi gini ka i nēguzo n'èzí? n'ihi na mu onwem edoziwo ulo, na ebe camel-i gānọ. 32 Nwoke ahu we ba n'ulo, ọ tọpu ibu camel-ya; ọ nye ya okporo-ọka na nri-anu-ulo inye camel-ya, na miri isa ukwu-ya na ukwu ndikom ndi ya na ha yikọrọ bia. 33 Ewe dọba nri n'iru ya iri: ma ọ siri, M'gaghi-eri, rue mb͕e m'gēkwuwori okwum nile. Ọ si, Kwue. 34 Ọ si, Orù Abraham ka m'bu. 35 Jehova agọziwo kwa onye-nwem nke-uku; o we di uku: O nyewo kwa ya ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, na ọla-ọcha na ọla-edo, na orù-ndikom na ndinyom nēje ozi, na camel na inyinya-ibu di ọtutu. 36 Sera, bú nwunye nke onye-nwem, we muara onye-nwem nwa-nwoke mb͕e ọ ghọsiri agadi: o we nye ya ihe nile o nwere. 37 Onye-nwem we me ka m'ṅua iyi, si, I gaghi-alutara nwam nwunye sitere n'umu-ndinyom nke ndi Kenean, ndi mu onwem bi n'ala-ha: 38 kama ọ bu ulo nnam ka i gējekuru, jekuru ab͕urum, lutara nwam nwunye. 39 M'we si onye-nwem, Eleghi anya nwayi ahu agaghi-esom je. 40 Ọ sim, Jehova, Onye m'jeghariworo n'iru Ya, gēziga mọ-ozi-Ya ka gi na ya yikọ je, Ọ gēme kwa ka ije-gi ga nke-ọma; i gāluta-kwa-ra nwam nwunye sitere n'ab͕urum, na n'ulo nnam: 41 mb͕e ahu i gāpu n'iyi i ṅurum, mb͕e i gābiakute ab͕urum; ọ buru kwa na ha enyeghi gi ya, i gāpu kwa n'iyi i ṅurum. 42 M'we bia ta rue isi-iyi ahu, si, Jehova, bú Chineke nke onye-nwem Abraham, biko, ọ buru na I nēme ijem nke mu onwem nēje ka ọ ga nke-ọma: 43 le, mu onwem nēguzo n'akuku isi-iyi miri a; ka o ru kwa, na nwa-ab͕ọgho ahu nke nāputa isere miri, onye m'gāsi ya, Biko, nyem nwantī miri site n'ite-gi ka m'ṅua; 44 onye gāsikwam, Gi onwe-gi ṅua, ọzọ kwa, camel-i ka m'gēsere miri nye: ka onye ahu buru nwayi Jehova rọputaworo nye nwa nke onye-nwem. 45 Ma tutu mu onwem agwasia obim okwu, le, Rebeka nāputa, ite-ya di kwa n'ubu-ya; ọ rida n'isi-iyi ahu, sere miri; m'we si ya, Biko, kwe ka m'ṅua. 46 Ọ me ngwa, si n'ubu-ya zie ite-ya, si, Ṅua, ọzọ kwa, camel-i ka m'gēme ka ha ṅua: m'we ṅua, camel ka ọ me-kwa-ra ka ha ṅua. 47 M'we jua ya, si, Nwa ònye ka i bu? Ọ si, Nwa Betuel ka m'bu, bú nwa Nehoa, onye Milka muru nye ya: m'we tiye nb͕a-aka ahu n'imi-ya, na ọla-aka abua ahu n'aka-ya abua. 48 M'we rube isi, kpọ isi ala nye Jehova, gọzie Jehova, bú Chineke nke onye-nwem Abraham, Onye durumri n'uzọ ezi-okwu ilutara nwa onye-nwem nwa nwa-nne-ya nwoke na nwunye. 49 Ma ub͕u a, ọ buru na unu gaje ime ebere na ezi-okwu n'ebe onye-nwem nọ, gosinum: ma ọ buru na unu agaghi-eme ya, gosinum; ka m'we che iru n'aka-nri, ma-ọbu n'aka-ekpe. 50 Leban na Betuel we za, si, N'aka Jehova ka okwu a siteworo: ayi apughi igwa gi ihe ọjọ ma-ọbu ezi ihe. 51 Le, Rebeka nọ n'iru gi, kuru ya, la, ka ọ ghọrọ nwa onye-nwe-gi nwunye, dika Jehova kwuworo. 52 O rue, mb͕e orù Abraham nuru okwu nile ha, na ọ kpọrọ isi ala nye Jehova. 53 Orù ahu we chiputa ihe ọla-ọcha, na ihe ọla-edo, na uwe, nye Rebeka: ihe di iche iche nke di oké ọnu-ahia ka ọ nyekwara nwa-nne-ya nwoke na nne-ya. 54 Ha we rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, ya onwe-ya na ndi ya na ha yikọrọ bia, ha we nọ ọnọdu-abali; ha we bilie n'ututu, ọ si, Zilagam na nke onye-nwem. 55 Ma nwa-nne-ya nwoke na nne-ya siri, Ka nwa-ab͕ọgho nọyere ayi ubọchi asa ma-ọbu iri; emesia ọ gēje. 56 Ọ si ha, Unu eb͕ochilam, ebe Jehova meworo ka uzọm ga nke-ọma; zilagam ka m'lakuru onye-nwem. 57 Ha si, Ayi gākpọ nwa-ab͕ọghọ ahu, juta ya n'ọnu-ya. 58 Ha we kpọ Rebeka, si ya, Ì gēso nwoke a je? Ọ si, M'gēje. 59 Ha we zilaga Rebeka, bú nwa-nne-ha, na nwayi nyere ya ara na nwata, na orù Abraham, na ndikom-ya. 60 Ha we gọzie Rebeka, si ya, Nwa-nne-ayi, gi onwe-gi ghọ nnù kwuru nnù madu, ọzọ, ka nkpuru-gi nweta ọnu-uzọ-ama nke ndi nākpọ ha asì. 61 Rebeka we bilie, ya na umu-ab͕ọghọ-ya, ha we nọkwasi n'elu camel-ha, so nwoke ahu je: orù ahu we kuru Rebeka, la. 62 Ma Aisak biarari site n'ije Bia-lahai-roi; n'ihi na ya onwe-ya bi n'ala Negeb. 63 Aisak we pua itughari uche-ya n'ọhia na mb͕e anyasi: ọ welie anya-ya abua, hu, ma, le, camel ufọdu nābia. 64 Rebeka we welie anya-ya abua, hu Aisak, si n'elu camel-ya rida. 65 Ọ si orù ahu, Ònye bu nwoke ahu nke nēje ije n'ọhia izute ayi? Orù ahu we si, Onye ahu bu onye-nwem: Rebeka we were ákwà-nkpudo-ya kpuchie onwe-ya. 66 Orù ahu we kọrọ Aisak akukọ bayere ihe nile o mere. 67 Aisak we me ka Rebeka bata n'ulo-ikwū Sera, bú nne-ya, o we kuru Rebeka, o we ghọ nwunye-ya; Aisak we hu ya n'anya: ewe kasie Aisak obi ka nne-ya nwusiri.

Jenesis 25

1 Abraham we luru nwunye ọzọ, nke aha-ya bu Ketura. 2 Ọ muara ya Zimram, na Jọkshan, na Medan, na Midian, na Ishbak, na Shua. 3 Jọkshan muru Sheba, na Dedan. Umu Dedan we buru Ashurim, na Letushim, na Leumim. 4 Umundikom Midian: Ifa na Ifēa, na Hanok, na Abida, na Eldea. Ndia nile bu umu Ketura. 5 Abraham we nye Aisak ihe nile o nwere. 6 Ma umu-ndikom nke iko-ndinyom nke Abraham nwere, Abraham nyere ha onyinye di iche iche; o we si n'ebe Aisak nwa-ya nọ zilaga ha n'Iru-anyanwu, rue ala Iru-anyanwu, mb͕e ọ nọ ndu. 7 Ma ndia bu ubọchi arọ nile nke ndu Abraham nke ọ diri, ọgu arọ asatọ na arọ iri na ise. 8 Abraham we kubie ume, nwua n'ezi isi-awọ, buru agadi, ndu-ya jukwara ya afọ; ewe chikọta ya na umu-nna-ya n'ala-mọ. 9 Aisak na Ishmael, bú umu-ya, we lìe ya n'ọb͕à Makpila, n'ọhia Efron nwa Zoha onye Het, nke di n'iru Mamre; 10 bú ọhia nke Abraham zutara n'aka umu Het: n'ebe ahu ka elìri Abraham na Sera, bú nwunye-ya. 11 O rue, mb͕e ọnwu Abraham gasiri, na Chineke gọziri Aisak nwa-ya; Aisak we biri n'akuku Bia-lahai-roi. 12 Ndia bu osuso-ọmumu Ishmael, nwa Abraham, onye Hega, bú nwayi Ijipt, bú nwayi nējere Sera ozi, muru nye Abraham: 13 ndia bu kwa aha umu-ndikom Ishmael, n'aha-ha, dika osuso-ọmumu-ha si di: ọkpara Ishmael, Nebaiot; na Kida, na Adbeel, na Mibsam, 14 na Mishma, na Duma, na Masa; 15 na Hedad, na Tima, na Jetua, na Nafish, na Kidema: 16 ndia bu umu-ndikom Ishmael, ndia bu kwa aha-ha, n'obodo ntà nile ha, na n'ebe-ulo-ikwū nile ha; ndi-isi iri na abua dika mba nile ha si di. 17 Ma ndia bu arọ nke ndu Ishmael, ọgu arọ isi na iri na asa: ọ we kubie ume, nwua; ewe chikọta ya na umu-nna-ya n'ala-mọ. 18 Ha we biri site na Havila rue Shua nke di n'iru Ijipt, mb͕e i nēje Asiria: n'iru umu-nne-ya nile ka ọ dara ada. 19 Ndia bu osuso-ọmumu Aisak nwa Abraham: Abraham muru Aisak: 20 Aisak b͕ara ọgu arọ abua mb͕e ọ lutara Rebeka na nwunye, bú nwa-nwayi Betuel onye Siria nke Padan-eram, nwa-nne-nwayi Leban onye Siria. 21 Aisak we riọ Jehova aririọ n'ihi nwunye-ya, n'ihi na nwayi-àgà ka ọ bu: Jehova we kwe ka ọ riọta ihe ọ riọrọ, Rebeka, bú nwunye-ya, we turu ime. 22 Umu-ya we b͕a nb͕a nime afọ ya; ọ si, Ọ buru na ọ di otú a, n'ìhi gini kwa ka mu onwem di ndu? Ọ we je iju Jehova ase. 23 Jehova we si ya, Mba abua di n'afọ-gi, Agēkewa kwa mba abua site n'úkwù-gi; Otù mba gēnwe ume kari mba ibe-ya; Nke-okenye gēfè nke-ntà. 24 Ubọchi-ya we zue imu nwa, ma, le, umu abua di n'afọ-ya. 25 Nke-mbu we puta nācha ọbara ọbara, aru-ya nile di ka uwe aji; ha we kpọ aha-ya Isọ. 26 Emesia nwa-nne-ya nwoke puta-kwa-ra, aka-ya nējide ikiri-ukwu Isọ; ewe kpọ aha-ya Jekob: Aisak b͕ara ọgu arọ atọ mb͕e Rebeka muru ha. 27 Umu-okoro ahu we tó etó: Isọ we buru nwoke mara ichu ntá, onye ọhia; ma Jekob bu nwoke zuru okè, nēbi n'ulo-ikwū. 28 Aisak we hu Isọ n'anya, n'ihi na ihe achutara na ntá nātọ ya utọ n'ọnu: ma Rebeka huru Jekob n'anya. 29 Jekob we sie ofé: Isọ we si n'ọhia bata, ya onwe-ya nāda kwa #mbà: 30 Isọ we si Jekob, Biko, kwe ka m'loda ufọdu nime ihe a nācha ọbara ọbara; n'ihi na ada-wom #mbà; n'ihi nka ka akpọrọ aha-ya Edom. 31 Jekob we si, Buru uzọ rebem ọnọdu-ọkpara-gi. 32 Isọ we si, Le, mu onwem gaje inwu anwu: ọ̀ gāba-kwa-ram urù gini, bú ọnọdu-ọkpara? 33 Jekob we si, Buru uzọ ṅuaram iyi; ọ ṅuara ya iyi: ọ we rebe Jekob ọnọdu-ọkpara-ya. 34 Jekob we nye Isọ achicha na ofé lentil; o rie ṅu kwa, o bilie, je nke ya: Isọ we leda ọnọdu-ọkpara-ya anya.

Jenesis 26

1 Oké unwu we di n'ala ahu, tukwasi oké unwu mbu nke di n'ubọchi Abraham. Aisak we jekuru Abimelek, bú eze ndi Filistia, rue Gera. 2 Jehova we me ka ọ hu Ya anya, Ọ si, Aridala n'Ijipt; biri n'ala ahu nke M'gāsi gi biri: 3 nọ dika ọbìa n'ala nka, M'gānọye-kwa-ra gi, gọzie gi; n'ihi na gi na nkpuru-gi ka M'gēnye ala ndia nile, M'gēme kwa ka iyi ahu guzosie ike, bú nke M'ṅuru Abraham nna-gi; 4 M'gēme kwa ka nkpuru-gi ba uba dika kpakpando nke elu-igwe, M'gēnye kwa nkpuru-gi ala ndia nile; ọ bu kwa na nkpuru-gi ka mba nile nke uwa gāgọzi onwe-ha; 5 n'ihi na Abraham gere nti n'olum, we debe ihe-ndebem, ihe nile M'nyere n'iwu, ukpurum nile, na iwum nile. 6 Aisak we biri na Gera: 7 ndikom ebe ahu we jua ya ajuju bayere nwunye-ya; ọ si, Nwa-nnem nwayi ka ọ bu: n'ihi na ọ turu egwu isi, Ọ bu nwunyem; ka ndikom ebe a we ghara ib͕um n'ihi Rebeka, ka o kwuru: n'ihi na nwayi nke di nma ile anya ka ọ bu. 8 O rue, mb͕e ubọchi ọ nọduru n'ebe ahu di anya, na Abimelek, bú eze ndi Filistia, leputara anya na window, hu, ma le, Aisak na Rebeka, bú nwunye-ya, nēgwu egwú. 9 Abimelek we kpọ Aisak, si, Le, nwunye-gi ka ọ bu n'ezie: ì si kwa aṅa si, Nwa-nnem nwayi ka ọ bu? Aisak we si ya, N'ihi na asirim, Ka m'ghara inwu anwu n'ihi ya. 10 Abimelek we si, Gini bu nka i meworo ayi? ọ fọduru nwantī na otù onye nime ndi nkem gēsowori nwunye-gi dina, i gēmewo-kwa-ri ka ikpe-ọmuma biakwasi ayi. 11 Abimelek we nye ndi-ya nile iwu, si, Onye nēmetu nwoke a ma-ọbu nwunye-ya aka, aghaghi ime ka ọ nwua. 12 Aisak we gha nkpuru n'ala ahu, hu n'arọ ahu ọgu ise ọgu ise: Jehova we gọzie ya. 13 Nwoke ahu we di uku, ọ ga n'iru, nāga n'iru n'idi uku rue mb͕e ọ di uku nke-uku: 14 ọ we nwe ihe-nnweta, bú ìgwè ewu na aturu, na ihe-nnweta, bú igwè ehi, na ọtutu ndi-orù: ndi Filistia we nēkwo ya ekworo. 15 Ma olùlù-miri nile nke ndi-orù nna-ya gwururi n'ubọchi Abraham nna-ya, ndi Filistia kpochiri ha, were kwa ájá kpojue ha. 16 Abimelek we si Aisak, Si n'ebe ayi nọ la; n'ihi na i nwe ume kari ayi nke-uku. 17 Aisak we si n'ebe ahu je, ma-ulo-ikwū-ya na ndagwurugwu Gera, biri n'ebe ahu. 18 Aisak we gwu kwa olùlù-miri nile ọzọ nke ha gwururi n'ubọchi Abraham nna-ya; n'ihi na ndi Filistia kpuchiri ha mb͕e ọnwu Abraham gasiri: ọ kpọ ha aha di ka aha nke nna-ya kpọrọ ha-ri. 19 Ndi-orù Aisak we gwue na ndagwurugwu ahu, chọta olùlù-miri nāsuputa asuputa. 20 Ndi-ọzùzù anu-ulo Gera we so ndi-ọzùzù anu-ulo Aisak nēse okwu, si, Ọ bu ayi nwe miri ahu: ọ kpọ aha olùlù-miri ahu Isek; n'ihi na ha chọrọ ya okwu. 21 Ha gwue olùlù-miri ọzọ, se kwa okwu bayere ya: ọ kpọ aha-ya Sitna. 22 O si n'ebe ahu kwapu, gwue olùlù-miri ọzọ; ma ha eseghi okwu bayere ya: ọ kpọ aha-ya Rehobot, si, N'ihi na ub͕u a Jehova enyewo ayi ebe sara mbara, ayi gamu kwa ọmùmù n'ala nka. 23 O si n'ebe ahu rigorue Bia-sheba. 24 Jehova we me ka ọ hu Ya anya n'abali ahu, si, Mu onwem bu Chineke nke Abraham nna-gi: atula egwu, n'ihi na Mu na gi nọ, M'gāgọzi kwa gi, me ka nkpuru-gi ba uba n'ihi Abraham, bú orùm. 25 Ọ we wue ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, kpọkue aha Jehova, ma ulo-ikwū-ya n'ebe ahu: ọ bu kwa n'ebe ahu ka ndi-orù Aisak gwuru olùlù-miri. 26 Abimelek we si na Gera jekuru ya, ya na Ahuzat, bú eyì-ya na Faikol, bú onye-isi usu-ndi-agha-ya. 27 Aisak we si ha, Gini mere unu ji biakutem, ebe unu onwe-unu nākpọm asì, we si n'ebe unu nọ zilagam? 28 Ha si, Ayi ahuwo nke-ọma na Jehova nọyere gi: ayi we si, Biko, ka iṅu-iyi di n'etiti ayi, bú n'etiti ayi na gi, ka ayi na gi b͕a kwa ndu; 29 na i gaghi-eme ayi ihe ọjọ ma-ọli dika ayi nēmetughi gi aka na dika ayi meworo gi nání ezi ihe, ayi we zilaga gi n'udo: ub͕u a gi onwe-gi bu onye agọziri agọzi nke Jehova. 30 Ọ we mere ha oké oriri, ha rie ṅu kwa. 31 Ha bilie n'isi-ututu, ṅuritara onwe-ha iyi: Aisak we zilaga ha, ha si n'ebe ọ nọ la n'udo. 32 O rue n'ubọchi ahu, na ndi-orù Aisak biara, kọrọ ya akukọ bayere olùlù-miri ahu nke ha gwuru, si ya Ayi achọtawo miri. 33 Ọ kpọ ya Shiba: n'ihi nka aha obobo ahu bu Bia-sheba rue ta. 34 Mb͕e Isọ b͕ara ọgu arọ abua ọ luru Judit na nwunye, bú nwa-nwayi Beiri onye Het, ya na Basemat, bú nwa-nwayi Ilon onye Het: 35 ha we ghọrọ Aisak, ghọkwara Rebeka, ihe mọ-ilu.

Jenesis 27

1 I O rue, mb͕e Aisak ghọrọ agadi, mb͕e anya-ya abua nāhu kwa inyogho-inyogho, nke mere ka ọ ghara ihu uzọ, na ọ kpọrọ Isọ, bú nwa-ya nke-okenye, si ya, Nwam: ọ si ya, Lekwam. 2 Ọ si, Biko, le, aghọwom agadi, amaghi ubọchi ọnwum. 3 Ma ub͕u a, biko, chiri ihe-gi, bú àkpà-àkú-gi na uta-gi, pua je ọhia, chutaram anu-nchuta; 4 sierem nri utọ, dika nke m'huru n'anya, butekwara m, ka m'we rie; ka nkpuru-obim we gọzie gi tutu mu anwua. 5 Ma Rebeka nānu ya mb͕e Aisak gwara Isọ, bú nwa-ya, okwu. Isọ we je ọhia ichuta anu-nchuta, na iweta ya. 6 Rebeka we gwa Jekob, bú nwa-ya, okwu, si Le, anurum nna-gi ka ọ nāgwa Isọ nwanne-gi okwu, si, 7 Wetaram anu-nchuta, sierem nri utọ, ka n'we rie, gọzi kwa gi n'iru Jehova tutu ọnwum. 8 Ma ub͕u a, nwam, ge nti n'olum, dika ihe nke mu onwem nēnye gi n'iwu si di. 9 Biko, je ebe ìgwè ewu na aturu di, si n'ebe ahu chitaram umu-ewu abua di nma; m'gēwere kwa ha siere nna-gi nri utọ, dika nke ọ huru n'anya: 10 i gēbuga-kwa-ra nna-gi, ka ọ we rie, ka ọ we gọzie gi tutu ọnwu-ya. 11 Jekob we si Rebeka nne-ya, Le, Isọ nwannem bu nwoke b͕ara aji, ma mu onwem bu nwoke nāb͕aghi aji. 12 Eleghi anya nnam gēbitum aka, m'agādi kwa ka onye nākwa emò n'anya-ya; m'gēme kwa ka nkọcha biakwasim, ọ bughi kwa ngọzi. 13 Nne-ya we si ya, Ya dikwasim, bú nkọcha-gi, nwam: nání ge nti n'olum, je chitaram ha. 14 Ọ je, chita, butere nne-ya: nne-ya we sie nri utọ, dika nke nna-ya huru n'anya. 15 Rebeka we chiri uwe di oké ọnu-ahia nke Isọ, bú nwa-ya nke-okenye nke di n'aka-ya n'ulo, ọ we yibe Jekob, bú nwa-ya nke-ntà: 16 ọ chiri kwa akpukpọ umu-ewu ahu yibe ya n'aka-ya abua na n'olu-ya ebe aji nādigh: 17 o nye Jekob, bú nwa-ya, nri utọ na achicha n'aka, bú nke o doziri. 18 O we biakute nna-ya, si Nna m: ọ si, Lekwam; ònye ka i bu, nwam? 19 Jekob we si nna-ya, Mu onwem bu Isọ ọkpara-gi; emewom dika i gwaram: biko, bilie, nọdu, rie ufọdu n'anu m'chutara, ka nkpuru-obi-gi we gọziem. 20 Aisak we si nwa-ya, Ì si kwa aṅa me ngwa ichọta ya, nwam? Ọ si, N'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, mere ka o zutem. 21 Aisak we si Jekob, Biko, bia nso, ka m'we bitu gi aka, nwam, ma gi onwe-gi bu nwam Isọ ahu, ma-ọbu na i bughi ya. 22 Jekob we jekuru Aisak nna-ya nso; o bitu ya aka, si, Olu a bu olu Jekob, ma aka ndia bu aka Isọ. 23 Ma ọ mataghi ya, n'ihi na aka-ya abua bu aji aji, dika aka Isọ nwa-nne-ya: o we gọzie ya. 24 Ọ si, Gi onwe-gi, ì bu kwa nwam Isọ? Ọ si, Mu onwem bu ya. 25 Ọ si, Buterem ya nso, ka m'ri kwa ufọdu nime anu nwam chutara, ka nkpuru-obim we gọzie gi. O we butere ya nso, o rie: o butekwara ya manya-vine, ọ nua. 26 Aisak nna-ya we si ya, Biko, bia nso, sutum ọnu nwam. 27 Ọ bia nso, sutu ya ọnu: o we nu ísi uwe-ya, gọzie ya, si, Le, ísì nwamDi ka ísi ọhia nke Jehova gọzi-woro: 28 Ka Chineke nye gi ufọdu nime igirigi elu-igwe, Na ufọdu nime ebe di urù nke ala, Na ọka na manya-vine ọhu ri nne: 29 Ka ndi di iche iche fè gi, Ka mba di iche iche kpọ isi ala nye gi: Buru onye nwere ike n'aru umunne-gi, Ka umu nke nne-gi kpọ kwa isi ala nye gi: Ka onye ọ bula nke nābu gi ọnu buru onye anābu ọnu, Ka onye ọ bula nke nāgọzi gi buru kwa onye agọziri agọzi. 30 O rue, mb͕e Aisak gọzisiri Jekob, mb͕e Jekob nọ kwa nāpù n'iru Aisak nna-ya ub͕u a, na Isọ nwa-nne-ya siri n'ichu-ntá-ya bata. 31 Ya onwe-yasi-kwa-ra nri utọ, butere nna-ya, si nna-ya, Ka nnam bilie, rie ufọdu nime anu nwa-ya chutara, ka nkpuru-obi-gi we gọziem. 32 Aisak nna-ya we si ya, Ònye ka i bu? Ọ si, Mu onwem bu nwa-gi, ọkpara-gi, bú Isọ. 33 Aisak we ma jijiji nke-uku nke-uku, si Ònye kwa bu onye ahu nke chutaworo anu-nchuta, buterem, m'we rie ufọdu nime nri ahu nile tutu i bia, m'we gọzie ya? onye agọziri agọzi ka ọ gābu kwa. 34 Mb͕e Isọ nuru okwu nna-ya ndia, o tie oké nkpu di ilu nke-uku, si nna-ya, Gọziem, ọbuná mu onwem, nnam. 35 Ọ si, Nwa-nne-gi biara n'aghughọ, nara ngọzi-gi. 36 Ọ si, Ọ̀ bu na akpọrọ aha-ya Jekob na o jidewom ikiri-ukwu ub͕ò abua ndia? ọnọdu-ọkparam ka ọ nara: ma, le, ub͕u a ka ọ naraworo ngọzim. Ọ si, Ọ̀ dighi ngọzi i debeworom? 37 Aisak we za, si Isọ, Le, edowom ya onye nwere ike n'aru gi, ọ bu kwa umunne-ya nile ka m'nyeworo ya ka ha buru ndi-orù-ya; ewerewokwam ọka na manya-vine ọhu me ka o guzosie ike: gini kwa ka m'gēmere gi, nwam? 38 Isọ we si nna-ya, Ọ̀ bu nání otú ngọzi ka i nwere, nnam? gọziem, ọbuná mu onwem, nnam. Isọ we welie olu-ya, kwa ákwá. 39 Aisak nna-ya we za, si ya, Le, site n'ebe di urù nke ala ka ebe-obibi-gi gādi, Site kwa n'igirigi nke elu-igwe site n'elu; 40 Ọ bu kwa mma-agha-gi ka i gēji di ndu, ọ bu kwa nwa-nne-gi ka i gēfe; O gēru kwa, mb͕e, i gālù, ulù, Na i gētijipu yoke-ya n'olu-gi. 41 Isọ we kpọ Jekob asì n'ihi ngọzi ahu nke nna-ya gọziri ya: Isọ we si n'obi-ya, Ubọchi iru-újú bayere nnam nābiaru nso; m'gēb͕u kwa Jekob nwa-nnem. 42 Ewe gosi Rebeka okwu ndia nke Isọ nwa-ya nke-okenye; o zìe, kpọ Jekob, bú nwa-ya nke-ntà, si ya, Le Isọ nwa-nne-gi nākasi onwe-ya obi bayere gi, nēzube ib͕u gi. 43 Ma ub͕u a, nwam, ge nti n'olum; bilie, b͕akuru Leban, bú nwa-nnem nwoke, rue Heran; 44 gi na ya nọ ubọchi ole-na-ole, rue mb͕e ọnuma nwa-nne-gi gālaghachi; 45 rue mb͕e iwe nwa-nne-gi gēsi n'aru gi laghachi, ọ we chezọ ihe i meworo ya: m'gēziga kwa, si n'ebe ahu kulata gi: n'ìhi gini ka m'gēji kwa b͕ara aka unu abua, bú umum, n'otù ubọchi? 46 Rebeka we si Aisak, Ike ndum agwusiwom site n'iru umu-ndinyom Het: ọ buru na Jekob luru nwunye sitere n'umu-ndinyom Het, dika ndia, bú site n'umu-ndinyom ala nka, ùrù gini ka ndu baram?

Jenesis 28

1 Aisak we kpọ Jekob, gọzie ya, nye ya iwu, si ya, Gi alula nwunye sitete n'umu-ndinyom Keneam. 2 Bilie, je Padan-eram, rue ulo Betuel, bú nna nne-gi; si n'ebe ahu lutara onwe-gi nwunye sitere n'umu-ndinyom Leban, bú nwa-nne-nwoke nne-gi. 3 Ka Chineke Nke puru ime ihe nile gọzie gi, me ka i mua, ọmùmù, Ya me kwa ka i ba uba, ka i we ghọ nkpọkọta nke ndi di iche iche: 4 Ya nye kwa gi ngọzi Abraham, gi, na nkpuru-gi tiyere gi; ka i we nweta ala nke ọnọdu-ọbìa-gi nile, nke Chineke nyere Abraham. 5 Aisak we zipu Jekob: ọ je Padan-eram, jekuru Leban, nwa Betuel onye Siria, bú nwa-nne-nwoke Rebeka, nne Jekob na Isọ. 6 Isọ we hu na Aisak gọziri Jekob, zipu kwa ya ije Padan-eram, isi n'ebe ahu lutara onwe-ya nwunye; ọ hu kwa na, mb͕e ọ nāgọzi ya, na ọ nyere ya iwu, si, Gi alula nwunye sitere n'umu-ndinyom Kenean; 7 ọ hu kwa na Jekob gere nna-ya, ge kwa nne-ya, nti, we je Padan-eram: 8 Isọ we hu na umu-ndinyom Kenean jọrọ njọ n'anya Aisak nna-ya; 9 Isọ we jekuru Ishmael lutara onwe-ya Mahalat na nwunye, bú nwa-nwayi Ishmael nwa Abraham, bú nwa-nne-nwayi Nebaiot, tiyere ndinyom ọ nwere. 10 Jekob we pua na Bia-sheba, nēje Heran. 11 Ọ biarue n'otù ebe, nọ ọnọdu-abali n'ebe ahu, n'ihi na anya-nwu adawo; ọ were otù nime nkume nke ebe ahu, dọba n'okpuru isi-ya, we dina n'ebe ahu 12 Ọ rọ nrọ, ma, le, ubube nke eguzoro n'ala, ma elu-ya nēmetu ebe elu-igwe di: ma, le, ndi-mọ-ozi Chineke nārigo nārida na ya. 13 Ma, le, Jehova nēguzo n'elu ya, si, Mu onwem bu Jehova, Chineke nke Abraham nna-gi, na Chineke nke Aisak' ala nke gi onwe-gi nēdina n'elu ya, gi ka M'gēnye ya, nye kwa nkpuru-gi; 14 nkpuru-gi gādi kwa ka ájá ala, i gāb͕asa n'uzọ Ọdida anyanwu na n'uzọ Iru-anyanwu na n'uzọ Ugwu na n'uzọ Ndida: agāgọzi kwa ab͕uru nile nke elu-uwa nime gi na nime nkpuru-gi. 15 Ma, le, Mu onwem nọyere gi, M'gēdebe kwa gi n'ebe ọ bula i nēje, M'gēme kwa ka i lata n'ala nka; n'ihi na M'gaghi-arapu gi, rue mb͕e m'gēmewori ihe M'gwaworo gi okwu bayere ya. 16 Jekob we teta n'ura-ya, si, N'ezie Jehova nọ n'ebe a; ma mu onwem amaghi ya. 17 Ọ tua egwu, si, Le, otú ebe a di egwù nke-uku! nka abughi ihe ọzọ ma-ọbughi nání ulo Chineke, nka bu kwa ọnu-uzọ-ama elu-igwe. 18 Jekob we bilie n'isi-ututu, were nkume ahu nke ọ dọbara n'okpuru isi-ya, do ya ka ọ buru ogidi, ọ wusa manu n'elu ya. 19 Ọ kpọ aha ebe ahu Bet-el: ma otú ọ di Luz bu aha obodo ahu na mbu. 20 Jekob we kwe nkwa, si, Ọ buru na Chineke gānọyerem, debem n'uzọ a nke mu onwem nēje, nyem nri ka m'we rie, na uwe ka m'we yie, 21 m'we lata n'ulo nnam n'udo, Jehova gābu-kwa-ram Chineke, 22 nkume a, nke m'doworo ka ọ buru ogidi, gābu kwa ulo Chineke: ihe nile I gēnyem, aghaghkwam inye Gi otù uzọ n'uzọ iri.

Jenesis 29

1 Jekob we zọlie ukwu-ya, jerue ala umu Iru-anyanwu. 2 Ọ hu, ma, le, olùlù-miri n'ọhia, ma, le, n'ebe ahu ìgwè ewu na aturu atọ nāmakpu n'akuku ya; n'ihi na ọ bu n'olùlù-miri ahu ka ha nēme ka ìgwè aturu-ha ṅua: nkume di kwa uku nke di n'elu ọnu olùlù-miri ahu. 3 Anāchikọta kwa ìgwè aturu nile n'ebe ahu: ha akpọrepu nkume ahu n'elu ọnu olùlù-miri ahu, me ka ìgwè ewu na aturu ṅua, ha eweghachi nkume n'elu ọnu olùlù-miri n'ọnọdu-ya. 4 Jekob we si ha, Umu-nnem, òle ebe unu si bia? Ha si, Heran ka ayi si bia. 5 Ọ si ha, Unu mara Leban nwa Nehoa? Ha si, Ayi mara ya. 6 Ọ si ha, Ọ̀ nọ n'udo? Ha si, Ọ nọ n'udo: ma, le, Rechel, bú nwa-ya nwayi, nābia, ya na ìgwè ewu na aturu-ya. 7 Ọ si, Le, ubọchi fọduru ri nne, nka abughi mb͕e anāchikọta anu-ulo: menu ka ìgwè ewu na aturu-unu ṅua miri, jenu zùa ha. 8 Ha si, Ayi apughi, rue mb͕e agāchikọta ìgwè aturu nile, ha we kpọrepu nkume n'elu ọnu olùlù miri a: ayi we me ka ìgwè ewu na aturu nua. 9 Mb͕e ọ nọ nākpayere ha uka, Rechel biara ya na ìgwè ewu na aturu nke nna-ya nwere; n'ihi na onye-ọzùzù-aturu ka ọ bu. 10 O rue, mb͕e Jekob huru Rechel, bú nwa-nwayi Leban nwa-nne-ya, na ìgwè ewu na aturu Leban, bú nwanne nne-ya, na Jekob jeruru nso, kpọrepu nkume ahu n'elu ọnu olùlù-miri ahu, me ka ìgwè ewu na aturu Leban, bú nwanne nne-ya, ṅua. 11 Jekob we sutu Rechel ọnu, welie olu-ya, kwa ákwá. 12 Jekob we gosi Rechel na nwa-nne nna-ya ka ọ bu, na nwa Rebeka ka ọ bu kwa: ọ we b͕a ọsọ, gosi nna-ya. 13 O rue, mb͕e Leban nuru akukọ Jekob, bú nwa nwa-nne-ya, na ọ b͕ara ọsọ izute ya, ọ b͕akua ya, sutu ya ọnu nke-uku, me ka ọ ba n'ulo-ya. Ọ we kọrọ Leban ihe nile ndia. 14 Leban we si ya, N'ezie ọkpukpum na anu-arum ka i bu. Ya na ya we nọ ogologo otù ọnwa. 15 Leban we si Jekob, Ọ̀ bu n'ihi na nwa-nnem ka i bu na i gēfèm n'efu? gosim, gini gābu ugwọ-ọlu-gi? 16 Ma Leban nwere umu-ndinyom abua: aha nke-okenye bu Lia, aha nke-ntà bu Rechel. 17 Anya Lia esighi ike; ma Rechel mara nma n'aru ma kwa nma ile anya. 18 Jekob we hu Rechel n'anya; ọ si, M'gēfè gi arọ asa n'ihi Rechel, bú nwa-gi nwayi nke-ntà. 19 Leban we si, Ọ di nma ka m'nye gi ya, kari were ya nye nwoke ọzọ: nọyerem. 20 Jekob we fè òfùfè n'ihi Rechel arọ asa; ha di n'anya-ya dika ubọchi ole-na-ole, n'ihi ihu-n'anya o ji hu ya. 21 Jekob we si Leban, Nyem nwunyem, n'ihi na ubọchim nile ezuwo, ka m'we bakuru ya. 22 Leban we chikọta ndi ebe ahu nile, me oké oriri. 23 O rue, n'anyasi, na o kuru Lia nwa-ya, me ka ọ bakuru Jekob; Jekob we bakuru ya. 24 Leban we nye ya Zilpa, bú nwayi nējere ya ozi, ka ọ buru nwayi nējere Lia nwa-ya nwayi ozi. 25 O rue na, n'ututu Jekob wee hu na nwanyi ahu bu Lia: ọ we si Leban, Gini bu nka i meworom? Ọ̀ bughi n'ihi Rechel ka m'efère òfùfè n'aka gi? n'ihi gini kwa ka i ghọb͕urum? 26 Leban we si, Adighi-eme otú a n'ebe nke ayi, inye nke-ntà tutu enye nke-okenye. 27 Debezue abali asa nke nwayi a, ma ayi gēnye kwa gi nwayi a n'ihi òfùfè i gēfè kwa ọzọ n'akam arọ asa ọzọ. 28 Jekob we me otú a, debezu abali asa nke Lia: ọ we nye ya Rechel nwa-ya na nwunye. 29 Leban we were Bilha, bú nwayi nējere ya ozi, nye Rechel nwa-ya nwayi, ka ọ buru nwayi nējere ya ozi. 30 Ọ we bakuru kwa Rechel, ọ we hu kwa Rechel n'anya kari Lia, we nēfè òfùfè n'aka Leban arọ asa ọzọ. 31 Jehova we hu na onye anākpọ asì ka Lia bu, Ọ we meghe àkpà-nwa-ya: ma Rechel bu nwayi-àgà. 32 Lia we turu ime, mua nwa-nwoke, kpọ aha-ya Reuben: n'ihi na ọ siri, N'ihi na Jehova elekwasiwo nweda-n'alam anya; n'ihi na ub͕u a dim gāhum n'anya. 33 Ọ turu ime ọzọ, mua nwa-nwoke; ọ we si, N'ihi na Jehova anuwo na onye anākpọ asì ka m'bu, n'ihi ya ka Ọ nye-kwa-ram nka: ọ we kpọ aha-ya Simeon. 34 Ọ turu ime ọzọ, mua-nwoke; ọ we si, Ub͕u a na mb͕e a ka dim gārapara n'arum, n'ihi na amuworom ya umu-ndikom atọ: n'ihi nka ka akpọrọ aha-ya Livai. 35 Ọ turu ime ọzọ, mua nwa-nwoke: ọ we si, Na mb͕e a ka m'gēkele Jehova: n'ihi nka ka ọ kpọrọ aha-ya Juda; ọ we kwusi imu nwa.

Jenesis 30

1 Ma mb͕e Rechel huru na ọ mughi umu nye Jekob, Rechel we kwo nwa-nne-ya nwayi ekworo. ọ si Jekob, Nyem umu, ma ọ buru na inyeghm, onye nwuru anwu ka m'bu. 2 Iwe Jekob we di ọku megide Rechel: ọ si, Ọ̀ bu n'ọnọdu Chineke ka m'nọ, Onye b͕ochiworo gi nkpuru nke afọ? 3 Rechel we si, Le, orùm nwayi Bilha, bakuru ya, ka ọ we mua nwa n'ikperem abua, ewe site kwa na ya wuliem elu dika ulo, ọbuná mu onwem. 4 Ọ nye ya Bilha na nwunye, bú nwayi nējere ya ozi: Jekob we bakuru ya. 5 Bilha we turu ime, muara Jekob nwa-nwoke. 6 Rechel we si, Chineke ekpeputawom, ọzọ kwa, ọ nuwo olum, we nyem nwa-nwoke: n'ihi nka ka ọ kpọrọ aha-ya Dan. 7 Bilha, bú nwayi nējere Rechel ozi, we turu ime ọzọ, muara Jekob nwa-nwoke nke-abua. 8 Rechel we si, Nb͕a Chineke ka mu na nwa-nnem nwayi b͕aworo, enwewokwam ike: o we kpọ aha-ya Naftali. 9 Mb͕e Lia huru na ọ kwusiri imu nwa, ọ were Zilpa, bú nwayi nējere ya ozi, nye Jekob na nwunye. 10 Zilpa, bú nwayi nējere Lia ozi, we muara Jekob nwa-nwoke. 11 Lia we si, Enwerem isi-ọma! ọ we kpọ aha-ya Gad. 12 Zilpa, bú nwayi nējere Lia ozi, we muara Jekob nwa-nwoke nke-abua. 13 Lia we si, Na mb͕e ọ nāgaram nke-ọma! n'ihi na umu-ndinyom madu akpọwom onye ihe nāgara nke-ọma: ọ we kpọ aha-ya Asha. 14 Reuben we je na mb͕e obìbì ọka wheat, chọta mandrake n'ọhia, chita ha nye Lia nne-ya. Rechel we si Lia, Biko, nyem ufọdu nime mandrake nwa-gi. 15 Ọ we si ya, Ọ̀bu okwu ntà na i narawo dim? ì gānara kwa mandrake nwam? Rechel we si, N'ihi nka gi na ya gēdina n'abali a n'ihi mandrake nwa-gi. 16 Jekob we si n'ọhia bata n'anyasi, Lia we pua izute ya, si, Mu ka i gābakute; n'ihi na achiriwom mandrake nwam gota gi n'ezie. Ọ we dinayere ya n'abali ahu, 17 Chineke we ge Lia nti, ọ we turu ime, muara Jekob nwa-nwoke nke-ise. 18 Lia we si, Chineke enyewom ugwo-ọlum, n'ihi na enyerem dim nwayi nējerem ozi' o we kpọ aha-ya Isaka. 19 Lia we turu ime ọzọ, muara Jekob nwa-nwoke nke-isi. 20 Lia we si, Chineke enyewom ezi onyinye; mb͕e a dim gēbiyerem, n'ihi na amuworom ya umu-ndikom isi: ọ we kpọ aha-ya Zebulun. 21 Emesia ọ mu-kwa-ra nwa-nwayi, kpọ aha-ya Daina. 22 Ma Chineke chetara Rechel, Chineke we ge ya nti, meghe àkpà-nwa-ya. 23 Ọ we turu ime, mua nwa-nwoke, si, Chineke ekpochapuwo ita-utam: 24 ọ we kpọ aha-ya Josef, si, Ka Jehova tukwasirim nwa-nwoke ọzọ. 25 O rue, mb͕e Rechel musiri Josef, Jekob siri Leban, Zilagam, ka m'we la n'ebem, na n'alam. 26 Nyem ndinyom na umum ndi m'fèworo gi òfùfè n'ihi ha, ka m'la kwa: n'ihi na gi onwe-gi amawo òfùfèm nke m'fèworo gi. 27 Leban we si ya, Biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru gi, gi nọgide: n'ihi na aribawom ama na Jehova agọziwom n'ihi gi. 28 Ọ si kwa, Kparam ókè ugwọ-ọlu-gi, m'gēnye kwa gi. 29 Ọ si ya, Gi onwe-gi amawo òfùfè m'fèworo gi, na ihe anu-ulo-gi ghọworo n'akam. 30 N'ihi na nwanti ka ihe i nwere bu tutu mu abia, ma ọ basawo rue ọtutu; Jehova agọziwo kwa gi n'ije-ukwum: ma ub͕u a òle mb͕e ka mu onwem gēme-kwa-ra ulom? 31 Ọ si, Gini ka m'gēnye gi? Jekob we si, I gaghi-enyem ihe ọ bula: ọ buru na i gēmerem ihe a, m'gāzù ìgwè ewu na aturu-gi ọzọ, debe kwa ya. 32 M'gāgabiga n'etiti ìgwè ewu na aturu-gi nile taa, si n'ebe ahu wezuga aturu ọ bula turu agwa na ntupọ, na aturu ọ bula di nji n'etiti aturu, na nke turu ntupọ na agwa n'etiti ewu: ọ gābu ugwọ-ọlum. 33 Ezi omumem gāza-kwa-ram n'ọdi-n'iru, mb͕e i gābia bayere ugwọ-ọlum nke di n'iru gi: nke ọ bula nke nātughi agwa na ntupọ n'etiti ewu, nkem nke nādighi kwa nji n'etiti aturu nkem, ihe ezuru ori ka nke ahu bu n'akam. 34 Leban we si, Le, biko, ya di ka okwu-gi si di. 35 O we wezuga n'ubọchi ahu nkpi nile dere ọcha na nke turu ntupọ, na nne-ewu nile turu agwa na ntupọ, nke ọ bula nke nwere ọcha nime ya, na nke ọ bula di nji n'etiti aturu, o nye ha n'aka umu-ya ndikom; 36 o je ije nke ubọchi atọ n'etiti ya na Jekob: ma Jekob nāzù ìgwè ewu na aturu Leban fọduru. 37 Jekob we chiri n'onwe-ya nkpa-n'aka nke osisi poplar di ndu, na nke osisi almond, na nke osisi plane; o kpechaputa ebe di ọcha nime ha, nēme ka ọcha nke di nime nkpa-n'aka ahu puta ìhè. 38 O we guzo nkpa-n'aka ahu nke o kpere na ncherita-iru ìgwè ewu na aturu n'ebe anētiye miri n'ihe anu-ulo ji aṅu miri, ebe ìgwè ewu na aturu nābia iṅu miri; ha we turu ime mb͕e ha biara iṅu miri. 39 Ìgwè ewu na aturu ahu we turu ime n'iru nkpa-n'aka ahu, ìgwè ewu na aturu ahu we mua umu dere ọcha, na nke turu agwa, na nke turu ntupọ. 40 Jekob we wezuga umu-aturu, me ka ìgwè ewu na aturu che iru na nke dere ọcha na nke ọ bula di nji n'ìgwè ewu na aturu Leban; o we do ìgwè nke aka ya n'onwe-ha iche, ma o doghi ha n'ebe ìgwè ewu na aturu Leban di. 41 O rue, mb͕e ọ bula ndi di ike nime ìgwè ewu na aturu turu ime, na Jekob tọb͕ọrọ nkpa-n'aka ahu n'iru anya ìgwè ewu na aturu n'ebe anētiye miri, ka ha we turu ime n'etiti nkpa-n'aka ahu; 42 ma mb͕e ìgwè ewu na aturu nādighi ike, ọ dighi-atọb͕ọ ha: ndi nādighi ike we diri Leban, ma ndi di ike diri Jekob. 43 Nwoke ahu we basa nke-uku nke-uku, ọ we nwe ìgwè ewu na aturu ri nne, na ndinyom nēje ozi, na orù-ndikom, na camel na inyinya-ibu di ọtutu.

Jenesis 31

1 Ọ we nu okwu nile nke umu-ndikom Leban, si, Jekob achiriwo ihe nile nna-ayi nwere; o sitekwara n'ihe nna-ayi nwere kpata àkù a nile. 2 Jekob we hu iru Leban, ma, le, ọ dighi n'ebe ọ nọ dika ọ di na mb͕e gara aga. 3 Jehova we si Jekob, Laghachi n'ala nna-gi-hà, laghachikuru umu-nna-gi; M'gānọyekwara gi. 4 Jekob we zìe kpọ Rechel na Lia bia n'ọhia rue ebe ìgwè ewu na aturu-ya di, 5 ọ si ha, Mu onwem nāhu iru nna-unu, na ọ dighi n'ebe m'nọ dika ọ di na mb͕e gara aga; ma Chineke nke nnam anọyeworom. 6 Unu onwe-unu makwara na ewerewom ikem nile fè nna-unu. 7 Ma nna-unu akwawom emò, we b͕anwe ugwọ-olum ub͕ò iri; ma Chineke ekweghi ya mejọm. 8 Ọ buru na otú a ka ọ nāsi, Ndi turu agwa gābu ugwọ-ọlu-gi; ìgwè ewu na aturu nile we nāmu umu turu agwa: ma ọ buru na otú a ka ọ nāsi, Ndi dere ọcha gābu ugwọ-ọlu-gi; ìgwè ewu na aturu nile we nāmu umu dere ọcha. 9 Chineke we napu anu-ulo nna-unu, nyem. 10 O rue, na mb͕e ìgwè ewu na aturu turu ime, na ewelirim anyam abua, hu nime nrọ, ma, le, nkpi nile nke nāb͕a ìgwè ewu dere ọcha, tu kwa agwa, tu kwa akika. 11 Mọ-ozi nke Chineke we sim nime nrọ ahu, Jekob; m'we si, Lekwam. 12 Ọ si, Biko, welie anya-gi abua, hu, nkpi nile nke nāb͕a ìgwè ewu dere ọcha, tu kwa agwa, tu kwa akika: n'ihi na ahuwom ihe nile Leban nēme gi. 13 Mu onwem bu Chineke nke Betel, ebe i tere ogidi manu, ebe i kwerem nkwa: ub͕u a bilie, si n'ala nka pua, laghachi n'ala nke ọmumu-gi. 14 Rechel na Lia we za, si ya, Ọ̀ di òkè ma-ọbu ihe-nketa ayi nwere n'ulo nna-ayi ọzọ? 15 Ọ̀ bughi na ndi ala ọzọ ka ọ guworo ayi? n'ihi na ọ rewo ayi, ripiasia kwa ego-ayi. 16 N'ihi na àkù nile nke Chineke napuworo nna-ayi, ọ bu ayi na umu-ayi nwe nke ahu: ub͕u a kwa, ihe ọ bula Chineke siri gi, me ya. 17 Jekob we bilie, palie umu-ya ndikom na ndinyom-ya dọkwasi ha n'elu camel-ya; 18 ọ we dupu anu-ulo-ya nile, na àkù-ya nile ọ kpatara, bú anu-ulo o nwetara, nke ọ kpatara na Padan-eram, ilakuru Aisak nna-ya rue ala Kenean. 19 Ma Leban jere ikpacha aji ìgwè ewu na aturu-ya: Rechel we zue teraphim nke nna-ya nwere n'ori. 20 Jekob we ghọb͕ue Leban onye Siria, n'ighara igosi ya na ya nāb͕alaga. 21 Ọ we b͕alaga, ya onwe-ya na ihe nile ọ nwere; ọ we bilie, gabiga Osimiri Yufretis, che iru-ya n'ugwu Gilead. 22 Ewe gosi Leban n'ubọchi nke-atọ na Jekob b͕alagarari. 23 Ọ we chiri umu-nne-ya tiyere onwe-ya, nāchu ya ije nke ubọchi asa, we chukuru ya n'ugwu Gilead. 24 Chineke we biakute Leban onye Siria nime nrọ abali, si ya, Lezie onwe-gi anya ka i ghara ikpayere Jekob uka, ma-ọbu nke di nma ma-ọbu nke jọrọ njọ. 25 Leban we rue Jekob aru. Ma Jekob marari ulo-ikwū-ya n'ugwu ahu: Leban na umu-nne-ya makwara ulo-ikwū-ha n'ugwu Gilead. 26 Leban we si Jekob, Gini bu ihe i mere, na i ghọb͕uwom, dupu kwa umum ndinyom dika ndinyom eji mma-agha dọta n'agha? 27 N'ìhi gini ka i b͕ala-gara na nzuzo, we ghọb͕uem? ọ̀ bụ kwa n'ihi gini ka i nēgosighm, ka m'we were ọṅù, were kwa abù, were kwa egwú-otiti, were kwa ubọ-akwara, zilaga gi? 28 ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka inekweghim ka m'sutu umum ndikom na umum ndinyom ọnu? ub͕u a i mewo ihe-nzuzu. 29 Ọ diri ike akam imejọ unu: ma Chineke nke nna-unu gwaram okwu n'abali nyahuru, si, Lezie onwe-gi anya ka i ghara ikpayere Jekob uka, ma-ọbu nke di nma ma-ọbu nke jọrọ njọ. 30 Ma ub͕u a, i lawo n'ezie, n'ihi na agu ulo nna-gi gusiri gi ike, ma n'ìhi gini ka i zuworo chim-hà? 31 Jekob we za, si Leban, N'ihi na aturum egwu: n'ihi na asirim, Ka i we ghara inapum umu-gi ndinyom n'ike. 32 Onye ọ bula i gāchọta chi-gi-hà n'aka-ya, ọ gaghi-adi ndu: n'iru umu-nne-ayi mata ihe nke gi di n'akam, were n'onwe-gi. N'ihi na Jekob amaghi na Rechel zuru ha-ri ori. 33 Leban we ba n'ulo-ikwū Jekob, na n'ulo-ikwū Lia, na n'ulo-ikwū orù-ndinyom abua; ma ọ chọtaghi ha. Ọ we si n'ulo-ikwū Lia pua, ba n'ulo-ikwū Rechel. 34 Ma Rechel wereri teraphim ahu, tinye ha nime ihe eji anọkwasi camel, we nọkwasi ha. Leban we bitu ulo-ikwū ahu nile aka, ma ọ chọtaghi ha. 35 Rechel we si nna-ya, Ya abula ihe iwe iwe di ọku n'anya onye-nwem na apughm ibili n'iru gi; n'ihi na ọ dim dika ọ nādi ndinyom. Ọ we chọsie ike, ma ọ chọtaghi teraphim ahu. 36 Jekob we we iwe di ọku, so Leban se okwu: Jekob we za, si Leban, Gini bu njehiem? gini bu nmehiem, na i chuworom n'ọku ọku? 37 Ọ bu ezie na i bituwo ihem nile aka, ma gini ka i chotaworo nime ihe nile nke ulo-gi? Tọb͕ọ ya ebe a n'iru umu-nnem na umu-nne-gi, ka ha we kpezie n'etiti ayi abua. 38 Orú arọ a ka mu onwem nọyeworo gi; nne-aturu-gi na nne-ewu-gi amukwoghi umu, erighkwa m ebulu nke ìgwè ewu na aturu-gi. 39 Nke anu-ọhia dọb͕uru, ewetaghi m ya nye gi; mu onwem nēdochi ya; site n'akam ka i nāchọ ya, ma-ọbu ihe ezuru n'ehihie ma-ọbu ihe ezuru n'abali. 40 Otú a ka m'nọworo; n'ehihie ọkpukpọ-nku ririm, ọtutu-oyi rikwara m n'abali; uram we fepu n'anyam abua. 41 Orú arọ a ka m'nọworo n'ulo-gi; m'efère gi arọ iri na anọ n'ihi umu-gi ndinyom abua, na arọ isi n'ihi ìgwè ewu na aturu-gi: i b͕anwewo kwa ugwọ-ọlum ub͕ò iri. 42 Ọ buru na Chineke nke nnam, bú Chineke nke Abraham, na Oké Egwù nke Aisak, anọghi n'akukum, n'ezie ub͕u a n'aka efu ka i gēzilagawomri. Nweda-n'alam na ndọb͕u m'ji akam abua nādọb͕u onwem n'ọlu ka Chineke huworo, Ọ̀ we bara gi nba n'abali nyahuru. 43 Leban we za, si Jekob, Umu-ndinyom ndia bu umu-ndinyom nkem, umu-ndikom ndia bu kwa umu-ndikom nkem, ìgwè ewu na aturu ndia bu kwa ìgwè ewu na aturu nkem, ihe ọ bula kwa gi onwe-gi nāhu, nkem ka ọ bu: ma umum ndinyom, gini ka m'gēmere ndia ta, gini ka m'gēme-kwa-ra umu-ha ndikom ndi ha mutara? 44 Ma ub͕u a bia, ka ayi b͕a ndu, mu na gi; ọ gābu kwa ihe-àmà n'etiti mu na gi. 45 Jekob we were nkume, guzo ya ka ọ buru ogidi. 46 Jekob we si umu-nne-ya, Chikọtanu nkume; ha we were nkume me obo: ha we rie nri n'ebe ahu n'akuku obo ahu. 47 Leban we kpọ ya Jega-sahaduta: ma Jekob kpọrọ ya Galeed. 48 Leban we si, Obo a bu ihe-àmà n'etiti mu na gi ta. N'ihi nka akpọrọ aha-ya Galeed: 49 na Mizpa, n'ihi na ọ siri, Ka Jehova che nche n'etiti mu na gi, mb͕e agēzopu ayi, otù onye n'ebe ibe-ya nọ. 50 Ọ buru na i weda umum ndinyom n'ala, ọ buru kwa na i kuru ndinyom tiyere umum ndinyom, ọ dighi onye ayi na ya nọ; le Chineke bu onye-àmà n'etiti mu na gi. 51 Leban we si Jekob, Le obo a, le kwa ogidi a, nke m'tob͕ọworo n'etiti mu na gi. 52 Ihe-àmà ka obo a bu, ihe-àmà ka ogidi a bu kwa, na mu onwem agaghi-agabiga obo a jekuru gi ma-oli, na gi onwe-gi agaghi-agabiga kwa obo a na ogidi a biakutem ma-ọli, ime ihe ọjọ. 53 Chineke nke Abraham, na Chineke nke Nehoa, bú Chineke nke nna-ha, kpe ikpe n'etiti ayi. Jekob we were Oké Egwù nke nna-ya Aisak ṅua iyi. 54 Jekob we chua àjà n'ugwu ahu kpọ umu-nne-ya ka ha rie nri: ha we rie nri, nọ ọnọdu-abali n'ugwu ahu. 55 Leban we bilie n'isi-ututu, sutu umu-ya ndikom na umu-ya ndinyom ọnu nke-uku, gọzie ha: Leban we la, laghachi n'ebe nke ya.

Jenesis 32

1 Ma Jekob jere n'uzọ-ya, ndi-mọ-ozi nke Chineke we zute ya. 2 mb͕e ọ huru ha Jekob siri, Ọmuma-ulo-ikwū Chineke ka nka bu: ọ we kpọ aha ebe ahu Mahanaim. 3 Jekob we zie ndi-ozi n'iru ya jekuru Isọ nwa-nne-ya rue ala Sia, bú ọhia Edom. 4 Ọ nye ha iwu, si Otú a ka unu gāsi onye-nwem Isọ; Otú a ka orù-gi Jekob siri, N'ulo Leban ka m'nọworo dika ọbìa, nọgide rue ub͕u a: 5 enwekwara m ehi, na inyinya-ibu, na ìgwè ewu na aturu, na orù-ndikom, na ndinyom nēje ozi: m'we zìe igosi onye-nwem, ihuta amara n'iru gi. 6 Ndi-ozi ahu we laghachikute Jekob, si, Ayi biakutere nwa-nne-gi Isọ, ọzọ kwa, ọ nābia izute gi, ya na nnù ndikom. 7 Jekob we tua egwu nke-uku, obi lọbakwara ya miri: ọ we kera ndi ya na ha nọ, na ìgwè ewu na aturu, na ìgwè ehi, na kamel, n'-omuma-ulo-ikwū abua; 8 ọ si, Ọ buru na Isọ abiarue otù ọmuma-ulo-ikwū, tib͕ue ya, ọmuma-ulo-ikwū nke fọduru gābu ndi b͕apuru ab͕apu. 9 Jekob we si, Chineke nke nnam Abraham, na Chineke nke nnam Aisak, Jehova, Nke nāsim, Laghachi n'ala-gi, laghachikuru umu-nna-gi, M'gēme kwa gi nma: 10 ekwe-sighm ebere nile, na ezi-okwu nile, nke I meworo orù-Gi: n'ihi na nkpa-n'akam ka m'were gabiga Jọdan nka; ma ub͕u a aghọwom ọmuma-ulo-ikwū abua. 11 Biko, naputam n'aka nwa-nnem, n'aka Isọ: n'ihi na mu onwem nātu egwu ya, ma eleghi anya ọ gābia, tib͕ue m, tib͕ukwa nne tinyere umu-ya. 12 Ma Gi onwe-gi siri, Aghaghm ime gi nma, M'gēme kwa nkpuru-gi ka ọ di ka ájá nke oké osimiri, nke anāpughi iguta ọnu n'ihi ọtutu ọ di. 13 O we nọ ọnọdu-abali n'ebe ahu abali ahu; o were kwa ufọdu nime ihe batara n'aka-ya ka ọ buru onyinye-inata-iru-ọma inye Isọ nwa-nne-ya; 14 ọgu nne-ewu iri na orú nkpi, ọgu nne-aturu iri na orú ebulu, 15 orú camel na iri nēnye umu ara na umu-ha, ọgu nne-ehi abua na oké-ehi iri, orú nne-inyinya-ibu na umu-inyinya-ibu iri. 16 Ọ nye ha n'aka ndi-orù-ya, n'ìgwè ichè; ọ si ndi-orù-ya, Gabiganu n'irum, me kwa mbara n'etiti ìgwè na ìgwè. 17 Ọ we nye onye mbu iwu, si, Mb͕e Isọ, bú nwa-nnem, gēzute gi, jua gi, si, Ònye nwe gi? òle ebe i nēje kwa? ọ̀ bu kwa onye nwe ihe ndia di n'iru gi? 18 I gāsi kwa, Orù-gi Jekob nwe ha; onyinye-inata-iru-ọma ka ọ bu ezitere onye-nwem Isọ: ma, le, ya onwe-ya nọ kwa n'azu ayi. 19 Ọ nye kwa onye nke-abua, na onye nke-atọ, na ndi nile nēso ìgwè nile, iwu, si, Dika okwu a si di ka unu gāgwa Isọ, mb͕e unu huru ya; 20 unu gāsi kwa, Ọzọ, le, orù-gi Jekob nọ n'azu ayi. N'ihi na ọ siri, Ka m'were onyinye-inata-iru-ọma nka nke nāga n'irum kpuchie anya-ya, emesia m'gāhu iru-ya; eleghi anya ọ gāhum iru-ọma. 21 Onyinye ahu inata iru-ọma we gabiga n'iru ya: ma ya onwe-ya nọ ọnọdu-abali n'ọmuma-ulo-ikwū-ya abali ahu. 22 Ọ we bilie n'abali ahu, chiri nwunye-ya abua, na ndinyom abua nējere ya ozi, na umu-ya iri na otù, gabiga ngabiga-miri Jakob. 23 O we chiri ha, me ka ha gabiga miri-iyi ahu, me kwa ka ihe o nwere gabiga. 24 O we fọdu Jekob nání ya; otú nwoke we so ya nāb͕a nb͕a rue chi-ọbubọ. 25 Mb͕e ọ huru na ọ pughi ijide ya, o metu isi-ọsu-ya; isi-ọsu Jekob we pua n'ọnọdu-ya, mb͕e ya na ya nab͕a nb͕a. 26 Ọ si Gham ka m'la, n'ihi na chi nābọ. Ọ si, M'gaghi-agha gi ka i la, ma ọ buru na i gọzighim. 27 Ọ si ya, Gini bu aha-gi? Ọ si, Jekob. 28 Ọ si, Ọ bughi Jekob ka agākpọ aha-gi ọzọ, kama Israel: n'ihi na i jisiwo ike n'ebe Chineke nọ na n'ebe madu nọ, i we nwe ike. 29 Jekob we jua ya, si Biko, gosim aha-gi. Ọ si N'ìhi gini kwa ka i nāju ajuju bayere aham? Ọ gọzie ya n'ebe ahu. 30 Jekob we kpọ aha ebe ahu Peniel: n'ihi na ahuwom Chineke iru na iru, ka o kwuru, ewe naputa ndum. 31 Anyanwu we wa-kwasi ya mb͕e ọ gabigara Penuel, ya onwe-ya we nēje nsukwara-achi. 32 N'ihi nka umu Israel adighi-eri akwara nke ọkpukpu-ukwu nke di n'isi-ọsu, rue ta: n'ihi na o meturu isi-ọsu Jekob n'akwara nke ọkpukpu-ukwu.

Jenesis 33

1 Jekob we welie anya-ya abua, hu, ma le, Isọ nābia, ya na nnù ndikom. Ọ we ke umu-ya nye Lia, nye kwa Rechel, nye kwa ndinyom abua ahu nēje ozi. 2 Ọ we do ndinyom ahu nēje ozi na umu-ha mbu, na Lia na umu-ya n'azu ha, na Rechel na Josef n'azu ha. 3 Ya onwe-ya we gabiga n'iru ha, kpọ isi ala ub͕ò asa, rue mb͕e ọ biaruru nwa-nne-ya nso. 4 Isọ we b͕a ọsọ izute ya, b͕akua ya, dakwasi ya n'olu, sutu ya ọnu: ha we kwa ákwá. 5 Ọ welie anya-ya abua, hu ndinyom na umu-ha; ọ si, Òle ndi bu ndia gi na ha yikọro? Ọ si, Umu nke Chineke nyeworo orù-gi n'amara. 6 Ndinyom ahu ndi nēje ozi we biarue nso, ha onwe-ha na umu-ha, ha kpọ isi ala. 7 Lia na umu-ya biaru-kwa-ra nso, kpọ isi ala: emesia Josef na Rechel biaru-kwa-ra nso, kpọ isi ala. 8 Ọ si, Ọmuma-ulo-ikwū nka nile nke m'zutere, ọ̀ bu gini n'ebe i nọ? Ọ si, Ihuta amara n'iru onye-nwem. 9 Isọ we si, Enwerem ri nne; nwa-nnem, ya diri gi, bú nke i nwere. 10 Jekob we si, É-è, biko, biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru gi, gi nara kwa n'akam onyinyem inata iru-ọma: n'ihi na ahuwom iru-gi dika anāhu iru Chineke, ihem we tọ gi utọ. 11 Biko, nara ngọzim nke ewetaworo gi; n'ihi na Chineke emewom amara, na n'ihi na enwerem ihe nile. O rugide ya, ọ we nara ya. 12 Ọ si, Ka ayi bulie ije, ka ayi la, ka m'je kwa n'iru gi. 13 Ọ si ya, Onye-nwem amawo na umum adighi ike, na ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi nke nēnye umu ara di kwa n'akam: ọ buru na achusie ha ike otù ubọchi, ìgwè ewu na aturu nile gānwu kwa, 14 Biko, ka onye-nwem gabiga n'iru orù-ya: ma mu onwem, ka m'nēdu ha nwayọ nwayọ, dika ije-ukwu anu-ulo nke di n'irum, na dika ije-ukwu nke umum si di, rue mb͕e m'gābiakute onye-nwem rue Sia. 15 Isọ we si, Biko, ka m'chiri madu ufọdu nime ndi mu na ha yikọrọ bia, debe n'ebe i nọ. Ọ si, N'ìhi gini kwa? ka m'huta amara n'iru onye-nwem. 16 Isọ we laghachi ubọchi ahu n'uzọ-ya ije Sia. 17 Jekob we bulie ije rue Sukot, wuere onwe-ya ulo, ma-kwa-ra anu-ulo-ya ulo-ntu: n'ihi nka akpọrọ aha ebe ahu Sukot. 18 Jekob we biarue Shelem, bú obodo Shekem, nke di n'ala Kenean, mb͕e o siri na Padan-eram bia; ọ ma ulo-ikwū-ya n'iru obodo ahu. 19 O we zuta òkè ọhia ahu, ebe ọ b͕asara ulo-ikwū-ya, n'aka umu Hemoa, bú nna Shekem, n'ọgu nkpuru-ego ise. 20 O guzo ebe-ichu-àjà ọtọ n'ebe, ahu, kpọ ya, El-elohe-Israel.

Jenesis 34

1 Daina, bú nwa-nwayi Lia, nke ọ muru nye Jekob, we pua ihu umu-ndinyom ala ahu. 2 Shekem, bú nwa-nwoke Hemoa onye-Haivait, onye-isi ala ahu, we hu ya; o kuru ya, dinayere ya, weda ya n'ala. 3 Nkpuru obi ya we rapara n'aru Daina nwa-nwayi Jekob, ọ hu nwa-ab͕oghọ ahu n'anya, gwa nwa-ab͕ọghb͕ọ ahu okwu nābà ya n'obi. 4 Shekem we gwa nna-ya Hemoa okwu, si, Lutaram nwata-nwayi a na nwunye. 5 Ma Jekob nuru na o merururi Daina nwa-ya nwayi; ma umu-ya ndikom nọyere anu-ulo-ya n'ọhia: Jekob we b͕a nkiti rue mb͕e ha biara. 6 Hemoa, bú nna Shekem, we pukuru Jekob ikpayere ya uka. 7 Umu-ndikom Jekob we si n'ọhia bata mb͕e ha nuru ya: ọ nēwuta ndikom ahu, ha nēwe iwe di ọku nke-uku, n'ihi na ọ bu ihe-nzuzu ka o mere n'Israel, n'idinayere nwa-nwayi Jekob; nke nēkwesighi ime otú a. 8 Hemoa we kpayere ha uka, si, Shekem, bú nwam, nkpuru-obi-ya nāhu nwa-unu nwayi n'anya si-ike: biko, werenu ya nye ya na nwunye. 9 Ka ayi na unu nālurita kwa nwunye; nyenu ayi umu-unu ndinyom, kurukwanu umu-ayi ndinyom n'onwe-unu. 10 Ayi na unu gēbi kwa: ala nka gādi n'iru unu; birinu nāzukwanu ahia nime ya, nwe-kwa-nu ihe-onwunwe nime ya. 11 Shekem we si nna Daina, ọ si kwa umu-nne-ya, Ka m'huta amara n'iru unu, ihe unu gāsikwam m'gēnye. 12 Me ka ọ ba uba nke-uku n'isim, bú ego-ilu-nwunye na onyinye, m'gēnye dika unu gāsim, ma nyenum nwa-ab͕ọghọ ahu na nwunye. 13 Umu-ndikom Jekob we were aghughọ za Shekem na Hemoa nna-ya, we kwue, n'ihi na ọ meruru Daina nwa-nne-ha, 14 ha we si ha, Ayi apughi ime ihe a, iwere nwa-nne-ayi nwayi nye nwoke nke anēbighi úgwù; n'ihi na ihe-ita-uta ka ọ buru ayi: 15 ọ bu nání ma asi na unu eme nka ka ayi gēkwere unu: ọ buru na unu gādi ka ayi, ka ebìe nwoke ọ bula n'etiti unu úgwù; 16 ayi gēnye kwa unu umu-ayi ndinyom, ọ bu kwa umu-unu ndinyom ka ayi gēkuru n'onwe-ayi, ayi na unu gēbi kwa, ghọ otù ndi. 17 Ma ọ buru na unu agaghi-ege ayi nti, ka ebìe unu úgwù; ayi gēkuru kwa nwa-ayi nwayi, la. 18 Okwu-ha nile we di nma n'anya Hemoa, na n'anya Shekem, bú nwa Hemoa. 19 Okorọbia ahu alaghi kwa azu ime ihe ahu, n'ihi na ihe nwa-nwayi Jekob tọrọ ya utọ: ya onwe-ya nwekwara nsọpuru kari ulo nile nke nna-ya. 20 Hemoa na Shekem nwa-ya we bia n'ọnu-uzọ-ama obodo-ha, gwa ndikom obodo-ha okwu, si, 21 Ndikom ndia, ndi-udo ka ha bu n'etiti ayi; ka ha biri kwa n'ala-ayi, zu kwa ahia nime ya; ala-ayi-kwa, le, ọ sara mbara n'aka abua n'iru ha; ka ayi lutara onwe-ayi umu-ha ndinyom na nwunye, ka ayi nye kwa ha umu-ayi ndinyom. 22 Ọ bu nání ma asi na ayi eme nka ka ndikom ahu gēkwere ayi ka ayi na ha biri, ighọ otù ndi, ọ buru na ebìe nwoke, ọ bula n'etiti ayi úgwù, dika ha onwe-ha bu ndi ebiri úgwù. 23 Anu-ulo-ha, na ihe ha nwetara, na anumanu-ha nile, ọ̀ bughi ayi gēnwe ha? ka ayi me nání nka, ka ayi kwere ha, ayi na ha gēbi kwa. 24 Ndi nile ndi si n'ọnu-uzọ-ama obodo-ya nāpu we ge Hemoa, ge kwa Shekem nwa-ya, nti; ewe bìe nwoke ọ bula úgwù, ndi nile ndi si n'ọnu-uzọ-ama obodo-ya nāpu. 25 O rue n'ubọchi nke-atọ, mb͕e o nēb͕u ha nb͕u, na madu abua n'etiti umu-ndikom Jekob, bú Simeon na Livai, umu-nne Daina, were mma-agha-ha n'otù n'otù, biakwasi obodo ahu mb͕e ọ di na ntukwasi-obi, ha we b͕ue ndikom nile. 26 Hemoa na Shekem nwa-ya ka ha b͕u-kwa-ra n'ọnu mma-agha, ha we kuputa Daina n'ulo Shekem, pua. 27 Umu-ndikom Jekob biakwasiri ndi eb͕uru eb͕u, luta obodo ahu n'agha, n'ihi na ha merururi nwa-nne-ha nwayi. 28 Ìgwè ewu na aturu-ha na ìgwè ehi-ha na inyinya-ibu nile ha, na ihe nke di n'obodo ahu, na ihe nke di n'ohia-ya, ka ha chiri; 29 àkù-ha nile, na umu-ntakiri-ha nile, na ndinyom-ha, ka ha dọtara n'agha, luta kwa ha n'agha, bú ihe nile nke di n'ulo-ha. 30 Jekob we si Simeon na Livai, Unu emekpawom aru, n'imem ka m'sì ísì n'etiti ndi bi n'ala nka, n'etiti ndi Kenean, na n'etiti ndi-Perizait: mu onwem kwa, ebe m'nwere ndikom ole-na-ole, ha gāchikọta onwe imegidem, tigbue m, agēme kwa ka m'tọb͕ọrọ n'efu, mu onwem na ulom 31 Ha we si, Ọ̀ gēme nwa-nne-ayi nwayi dika anēme nwayi nākwa iko?

Jenesis 35

1 Chineke we si Jekob, Bilie, rigoro Betel, biri n'ebe ahu: mekwara Chineke ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, bú Onye mere ka i hu Ya anya mb͕e ināb͕apu n'iru Isọ nwa-nne-gi. 2 Jekob we si ulo-ya, ọ si kwa ndi nile ya na ha bi, Wezuganu chi nile nke ndi ala ọzọ nke di n'etiti unu, menu onwe-unu ka unu di ọcha, b͕anwe-kwa-nu uwe-unu: 3 ka ayi bili kwa, rigoro Bet-el; m'gēmekwara Chineke ebe-ichuaja n'ebe ahu, bú Onye nāzam n'ubọchi ahuhum, we nọyerem n'uzọ nke m'jere. 4 Ha we nye Jekob chi nile nke ndi ala ọzọ nke di n'aka-ha, na nb͕a-aka nile nke di na nti-ha; Jekob we zobe ha n'okpuru osisi terebinth nke di nso Shekem. 5 Ha we bulie ije: ujọ nke Chineke we dikwasi obodo nile nke di ha buruburu, ha achughi kwa umu-ndikom Jekob. 6 Jekob we biarue Luz, nke di n'ala Kenean (nke ahu bu Bet-el), ya onwe-ya na ndi nile ya na ha yikọrọ bia. 7 O wue ebe-ichu-aja n'ebe ahu, kpọ ebe ahu El-bet-el: n'ihi na ebe ahu ka Chineke kpughere Onwe-ya nye ya, mb͕e ọ nab͕apu n'iru nwa-nne-ya. 8 Debora, bú nwayi nyere Rebeka ara na nwata, we nwua, elìe ya n'okpuru Bet-el n'okpuru osisi oak: ewe kpọ aha-ya Alon-bakut. 9 Chineke we me ka Jekob hu Ya anya ọzọ, mb͕e o siri na Padan-eram bia, Ọ gọzie ya. 10 Chineke we si ya, Aha-gi bu Jekob: agaghi-akpọ aha-gi Jekob ọzọ, kama Israel gābu aha-gi: Ọ we kpọ aha-ya Israel. 11 Chineke we si ya, Mu onwem bu Chineke Nke puru ime ihe nile: gi mua ọmùmù ba kwa uba; mba na nkpọkọta mba gādi site na gi, ndi-eze gēsi kwa n'úkwù-gi puta; 12 ala nke M'nyere Abraham na Aisak, gi ka M'gēnye ya, ọ bu kwa nkpuru-gi gānọchi gi ka M'gēnye ala nka. 13 Chineke we si n'ebe ọ nọ rigo n'ebe Ọ kpayere ya uka. 14 Jekob we guzo ogidi ọtọ n'ebe ahu ebe Ọ kpayere ya uka, bú ogidi nkume: ọ wusi àjà-ihe-ọṅuṅu n'elu ya, wusa kwa manu n'elu ya. 15 Jekob we kpọ aha ebe ahu ebe Chineke kpayere ya uka Bet-el. 16 Ha we si na Bet-el bulie ije; ma uzọ fọduru ibiaru Efrat: Rechel we nāmu nwa, ime nēmesi kwa ya ike mb͕e ọ nāmu nwa. 17 O rue, mb͕e ime nēmesi, ya ike, na nwayi nke nēle ime siri ya, Atula egwu; n'ihi na nka bu kwa nwa-nwoke i gēnwe. 18 O rue, mb͕e nkpuru-obi-ya nāpu (n'ihi na ọ nwuru), na ọ kpọrọ aha-ya Ben-oni: ma nna-ya kpọrọ ya Benjamin. 19 Rechel we nwua, elìe ya n'uzọ Efrat (nke ahu bu Bet-lehem). 20 Jekob we guzo ogidi ọtọ n'elu ílì-ya: nke ahu bu Ogidi ílì Rechel rue ta. 21 Israel we bulie ije, seti ulọ ikwū ya n'ofè ulo-elu Ida. 22 O rue, mb͕e Israel biri n'ala ahu, na Reuben jere dinayere Bilha, bú iko-nwayi nna-ya: Israel we nu ya. Ma umu-ndikom Jekob di iri na abua: 23 umu-ndikom Lia; Reuben, bú ọkpara Jekob, na Simeon, na Livai, na Juda, na Isaka, na Zebulun: 24 umu-ndikom Rechel; Josef na Benjamin: 25 umu-ndikom Bilha, bú nwayi nējere Rechel ozi; Dan na Naftali: 26 umu-ndikom Zilpa, bú nwani nējere Lia, ozi; Gad na Asha: ndia bu umu-ndikom Jekob, nke amuru nye ya na Padan-eram. 27 Jekob we biakute Aisak, bú nna-ya, na Mamre, bú Kiriat-aba (nke ahu bu Hebron), ebe Abraham na Aisak nọrọ dika ọbìa. 28 Ubọchi Aisak we buru ọgu arọ iteghete. 29 Aisak we kubie ume, nwua, ewe chikọta ya na umu-nna-ya n'ala-mọ, ọ bu agadi, ubọchi-ya jukwara ya afọ: Isọ na Jekob, bú umu-ya ndikom, we lìe ya.

Jenesis 36

1 Ma ndia bu osuso-ọmumu Isọ (nke ahu bu Edom). 2 Isọ luru ndinyom-ya site n'umu-ndinyom Kenean; Eda nwa-nwayi Ilon onye Het, na Ọhọlibama nwa-nwayi Ana, bú nwa-nnanyi Zibeon onye-Haivait; 3 na Basemat nwa-nwayi Ishmael, nwa-nne-nwayi Nebaiot. 4 Eda we muara Isọ Elifaz; Basemat mukwara Reuel; 5 Ọhọlibama mu-kwa-ra Jeush, na Jalam, na Kora: ndia bu umu-ndikom Isọ, nke amuru nye ya n'ala Kenean. 6 Ma Isọ chiri ndinyom-ya, na umu-ya ndikom, na umu-ya ndinyom, na madu nile nke ulo-ya, na anu-ulo-ya, na anumanu-ya, na ihe nile ọ nwetara, nke ọ kpatarari n'ala Kenean; ọ we si n'iru Jekob, bú nwa-nne-ya, je ala ọzọ. 7 N'ihi na àkù-ha riri nne kari ibikọ n'otù nke ọnọdu-ọbìa-ha nile apughi kwa inagide ha n'ihi anu-ulo-ha. 8 Isọ we biri n'ugwu Sia: Isọ bu Edom. 9 Ma ndia bu osuso-ọmumu Isọ, nna Edom, n'ugwu Sia. 10 Ndia bu aha umu-ndikom Isọ: Elifaz nwa Eda nwunye Isọ, Reuel nwa Basemat nwunye Isọ. 11 Umu-ndikom Elifaz bu Timan, na Oma, na Zefo, na Gatam, na Kenaz. 12 Timna bukwara Elifaz nwa Isọ iko-nwayi; ọ muara Elifaz Amalek: ndia bu umu-ndikom Eda nwunye Isọ. 13 Ndia bu kwa umu-ndikom Reuel; Nahat, na Zera, na Shama, na Miza: ndia bu umu-ndikom Basemat nwunye Isọ. 14 Ndia bu kwa umu-ndikom Ọhọlibama nwa-nwayi Ana, bú nwa-nwayi Zibeon, nwunye Isọ: o we muara Isọ Jeush, na Jalam, na Kora. 15 Ndia bu ndi-isi nke umu Isọ: umu-ndikom Elifaz ọkpara Isọ; Timan onye-isi, Oma onye-isi, Zefo onye-isi, Kenaz onye-isi. 16 Kora onye-isi, Gatam onye-isi, Amalek onye-isi: ndia bu ndi-isi Elifaz n'ala Edom; ndia bu umu-ndikom Eda. 17 Ndia bu kwa umu-ndikom Reuel nwa-nwoke Isọ; Nahat onye-isi, Zera onye-isi, Shama onye-isi, Miza onye-isi: ndia bu ndi-isi Reuel n'ala Edom; ndia bu umu-ndikom Basemat nwunye Isọ. 18 Ndia bu kwa umu-ndikom Ọhọlibama nwunye Isọ; Jeush onye-isi, Jalam onye-isi, Kora onye-isi: ndia bu ndi-isi Ọhọlibama nwa-nwayi Ana, nwunye Isọ. 19 Ndia bu umu Isọ, ndia bu kwa ndi-isi-ha: nke ahu bu Edom. 20 Ndia bu umu-ndikom Sia onye Hoa, ndi bi n'ala ahu; Lotan, na Shobal, na Zibeon, na Ana, 21 na Dishon, na Iza Dishan: ndia bu ndi-isi ndi Hoa, umu Sia n'ala Edom. 22 Umu-ndikom Lotan bu Hori na Himam; nwanne-nwayi Lotan bu kwa Timna. 23 Ndia bu kwa umu-ndikom Shobal; Alvan, na Manahat, na Ibal, na Shefo, na Onam. 24 Ndia bu kwa umu-ndikom Zibeon; Aia, na Ana: onye ahu bu Ana onye hutara isi-iyi nke miri di ọku n'ọzara, mbe ọ nāzù inyinya-ibu Zibeon, bú nna-ya, nwere. 25 Ndia bu kwa umu-ndikom Ana; Dishon, na Ọhọlibama nwa-nwayi Ana. 26 Ndia bu kwa umu-ndikom Dishon; Hemdan, na Eshban, na Itran, na Keran. 27 Ndia bu umu-ndikom Iza; Bilhan, na Zaavan, na Akan. 28 Ndia bu umu-ndikom Dishan; Uz, na Aran. 29 Ndia bu ndi-isi ndi Hoa; Lotan onye-isi, Shobal onye-isi, Zibeon onye-isi, Ana onye-isi, 30 Dishon onye-isi, Iza onye-isi, Dishan onye-isi: ndia bu ndi-isi ndi Hoa, dika ndi-isi-ha si di n'ala Sia. 31 Ndia bu eze ndi bu eze n'ala Edom, tutu eze ọ bula bu eze umu Israel. 32 Bela nwa Beoa bu eze n'Edom; aha obodo-ya bu Dinhaba. 33 Bela we nwua, Jobab nwa Zera, nke sitere na Bozra, we buru eze n'ọnọdu ya. 34 Jobab we nwua, Husham, nke sitere n'ala ndi Timan, we buru eze n'ọnọdu ya. 35 Husham we nwua, Hedad nwa Bedad, onye tib͕uru Midian n'ọhia Moab, we buru eze n'ọnọdu ya: aha obodo-ya bu Avit. 36 Hedad we nwua, Samla, nke sitere na Masrika, we buru eze n'ọnọdu ya. 37 Samla we nwua, Shaul, nke sitere na Rehobot n'usọ Osimiri, we buru eze n'ọnọdu ya. 38 Shaul we nwua, Beal-hanan nwa Akboa we buru eze n'ọnọdu ya. 39 Beal-hanan nwa Akboa we nwua, Heda we buru eze n'ọnọdu ya: aha obodo-ya bu Pau; aha nwunye-ya bu Mehetabel nwa Matred, bú nwa-nwayi Me-zahad. 40 Ndia bu kwa aha ndi-isi Isọ, dika ab͕uru nile ha si di, dika ebe nile si di, n'aha nile ha; Timna onye-isi, Alva onye-isi, Jetet onye-isi; 41 Ọhọlibama onye-isi, Ila onye-isi, Pinon onye-isi; 42 Kenaz onye-isi, Timan onye-isi, Mibza onye-isi; 43 Magdiel onye-isi, Iram onye-isi: ndia bu ndi-isi Edom, dika ebe-obibi-ha si di n'ala onwunwe-ha. Onye ahu bu Isọ nna Edom.

Jenesis 37

1 Jekob we biri n'ala ọnọdu-ọbìa nile nke nna-ya, n'ala Kenean. 2 Ndia bu osuso-ọmumu Jekob. Mb͕e Josef b͕ara arọ iri na asa, ọ nāzù ìgwè ewu na aturu, ya na umu-nne-ya; ya onwe-ya bu nání nwata, ya na umu Bilha na umu Zilpa, bú ndinyom nna-ya, yikọrọ zù ewu na aturu: Josef we wetara nna-ha akukọ ihe ọjọ ha. 3 Ma Israel huru Josef n'anya kari umu-ya nile, n'ihi na nwa agadi-ya ka ọ bu: o we mere ya uwe-nwuda nwere aka. 4 Umu-nne-ya we hu na ọ bu ya onwe-ya ka nna-ha huru n'anya kari umu-nne-ya nile; ha we kpọ ya asì, ha apughi kwa igwa ya okwu n'udo. 5 Josef we rọ nrọ, gosi ya umu-nne-ya: ha we kpọ ya asì ọzọ kari. 6 Ọ si ha, Biko, nurunu nrọ a nke m'rọworo: 7 ma, le, ayi onwe-ayi nēke ùkwù-ọka n'etiti ubi, ma, le, ùkwù-ọka nkem biliri, guzo kwa onwe-ya ọtọ; ma, le, ùkwù-ọka-unu nāb͕a gburugburu, kpọ isi ala nye ùkwù-ọka nkem. 8 Umu-nne-ya we si ya, Ì gābu eze-ayi n'ezie? ma-ọbu ì gāchi ayi n'ezie? Ha we kpọ ya asì ọzọ kari n'ihi nrọ-ya nile, na n'ihi okwu-ya nile. 9 Ọ we rọ kwa nrọ ọzọ, kọrọ ya umu-nne-ya, si, Le, arọwom nrọ ọzọ; ma, le, anyanwu na ọnwa na kpakpando iri na otù nākpọ isi ala nyem. 10 Ọ we kọrọ ya nna-ya, kọkwara umu-nne-ya; nna-ya we basiere ya nba ike, si ya, Gini bu nrọ a nke i rọworo? Mu onwem na nne-gi na umu-nne-gi, àyi gābia n'ezie ikpọ isi ala nye gi? 11 Umu-nne-ya we kwo ya ekworo; ma nna-ya debere okwu ahu. 12 Umu-nne ya we je izù ìgwè ewu na aturu nke nna-ha na Shekem. 13 Israel we si Josef, Umu-nne-gi, hà adighi-azù ewu na aturu na Shekem? bia, m'gēzì kwa gi jekuru ha. Ọ si ya, Lekwam. 14 Ọ si ya, Biko, je le ma umu-nne-gi nọ n'udo, ma ìgwè ewu na aturu di kwa n'udo; weghachikwaram okwu. O si na ndagwurugwu Hebron ziga ya, o we biarue Shekem. 15 Otù nwoke we hu ya, ma, le, ọ nāwaghari n'ọhia: nwoke ahu we jua ya, si, Gini ka i nāchọ? 16 Ọ si Umu-nnem ka m'nāchọ: biko, gosim ebe ha nāzù ewu na aturu. 17 Nwoke ahu we si, Ha esiwo n'ebe a bulie ije: n'ihi na anurum ka ha nāsi, K'ayi je Dotan. Josef we so umu-nne-ya, chọta ha na Dotan. 18 Ha we hu ya n'ebe di anya, ma tutu ọ biakute ha nso, ha b͕agide ya ìzù ọjọ ime ka ọ nwua. 19 Ha we sìrita onwe-ha, Le, ọ̀kà-nrọ a nābia. 20 Ma ub͕u a, bianu, ka ayi b͕ue ya, tubà ya n'otù nime olùlù ndia, ayi gāsi kwa, Ajọ anu eriwo ya: ayi gāhu kwa ihe nrọ-ya nile gābu. 21 Reuben we nu ya, naputa ya n'aka-ha, si, Ka ayi ghara itib͕u ya. 22 Reuben we si ha, Unu awusila ọbara; tubànu ya n'olùlù a nke di n'ọzara, ma unu esetila aka imegide ya: ka o we naputa ya n'aka-ha, ime ka ọ laghachikuru nna-ya. 23 O rue, mb͕e Josef biakutere umu-nne-ya, na ha yipuru Josef uwe-ya, bú uwe-nwuda ahu nwere aka nke di n'aru ya; 24 ha kuru ya, tubà ya n'olùlù ahu: ma olùlù ahu tọb͕ọrọ n'efu, miri adighi nime ya. 25 Ha we nọdu iri nri: ha we welie anya-ha, hu, ma, le usu-ije ndi Ishmael si na Gilead nābia, camel-ha nēbu kwa uda na balm na myrrh, nēje iweda ya n'Ijipt. 26 Juda we si umu-nne-ya, Ùrù gini di ya mb͕e ayi gēb͕u nwa-nne-ayi, zo ọbara-ya? 27 Bianu, ka ayi re ya nye ndi Ishmael ndia, aka-ayi adi-kwa-la n'aru ya; n'ihi na nwa-nne-ayi, bú anu-aru-ayi, ka ọ bu. Umu-nne-ya we nu olu-ya. 28 Ndi Midian, bú ndi-ahia, we gabiga; ha we sere Josef, si n'olùlù dọlite ya, re Josef nye ndi Ishmael n'orú nkpuru-ego ọla-ọcha. Ha we kubata Josef n'Ijipt. 29 Reuben we biaghachi n'olùlù ahu; ma, le, Josef anọghi n'olùlù ahu; ọ we dọwa uwe-ya nile. 30 O we laghachikuru umu-nne-ya, si, Nwata ahu anọghi; ma mu onwem, òle ebe mu onwem gēje? 31 Ha we chiri uwe Josef, b͕u kwa nkpi, biaye uwe ahu nime ọbara-ya, 32 ziga uwe-nwuda ahu nwere aka, chita ya nye nna-ha, si, Nka ka ayi hutaworo: biko, mata ma uwe nwa-gi ka ọ bu ma-ọbu na ọ bughi ya. 33 Ọ we mata ya, si, Ọ bu uwe nwam; ajọ anu eriwo ya; anu-ọhia adọb͕uwo Josef n'ezie. 34 Jekob we dọwa uwe-nb͕okwasi-ya nile, yiri ákwà-nkpe n'úkwù-ya, ruru nwa-ya újú ọtutu ubọchi. 35 Umu-ya ndikom nile na umu-ya ndinyom nile we bilie ikasi ya obi; ma ọ juru, na agaghi-akasi ya obi; ọ si, N'ihi na m'gāridakuru nwam rue ala-mọ nēru újú. Nna-ya we kwara ya ákwá. 36 Ndi Midian we rerue ya Ijipt nye Potifa, onye nējere Fero ozi, onye-isi nke ndi-ob͕ū.

Jenesis 38

1 O rue, na mb͕e ahu, na Juda siri n'ebe umu-nne-ya nọ rida, si n'ije-ya wezuga onwe-ya ba n'ulo otù nwoke, bú onye Adulam, onye aha-ya bu Haira. 2 Juda we hu n'ebe ahu nwa-nwayi nke otù nwoke, bú onye Kenean, nke aha-ya bu Shua; ọ we kuru ya, bakuru ya. 3 Ọ we turu ime, mua nwa-nwoke; Juda we kpọ aha-ya Ia. 4 Ọ we turu ime ọzọ, mua nwa-nwoke, kpọ aha-ya Onan. 5 Ọ we mu kwa nwa-nwoke ọzọ, kpọ aha-ya Shila: ma Juda nọ na Kezib mb͕e ọ muru ya. 6 Juda we lutara Ia ọkpara-ya nwunye, nke aha-ya bu Tema. 7 Ma Ia, bú ọkpara Juda, jorọ njọ n'anya Jehova, Jehova we me ka ọ nwua. 8 Juda we si Onan, Bakuru nwunye nwa-nne-gi, we luara ya ọlu nwa-nne di, me ka nkpuru tolitere nwa-nne-gi. 9 Ma Onan mara na ọ bughi ya gēnwe nkpuru ahu; o we rue, na mb͕e ọ bula ọ bakuru nwunye nwa-nne-ya, na ọ wusiri ya n'ala, ka ọ we ghara inye nwa-nne-ya nkpuru. 10 Ma ihe ọ mere jọrọ njọ n'anya Jehova; O we me ka ọ nwu kwa. 11 Juda we si Tema, bú nwunye nwa-ya, Nọdu n'ọnọdu nwayi di-ya nwuru n'ulo nna-gi, rue mb͕e Shila, bú nwam, gētozù: n'ihi na ọ siri, Ka ya onwe-ya we ghara inwu kwa, dika umu-nne-ya. Tema we je nọdu n'ulo nna-ya. 12 Ubọchi gabigara we di ọtutu, nwa-nwayi Shua, bú nwunye Juda, we nwua; ewe kasie Juda obi, o we rigokuru ndi nākpacha aji ìgwè ewu na aturu-ya rue Timna, ya onwe-ya na Haira, bú enyì-ya, bú onye Adulam ahu. 13 Ewe gosi Tema, si, Le, nna di-gi nārigoru Timna ikpacha aji ìgwè ewu na aturu-ya. 14 O we chipu n'aru ya uwe ọnọdu nwayi di-ya nwuru nke ya, were ákwà-nkpudo-ya kpuchie onwe-ya, fuchi onwe-ya, nọdu n'onu-uzọ Enaim, nke di n'uzọ Timna; n'ihi na ọ huru na Shila etozuwori, ma eweghi ya onwe-ya nye ya na nwunye. 15 Juda we hu ya, che na ọ bu nwayi nākwa iko; n'ihi na o kpuchiri iru-ya. 16 O we si n'ije-ya wezuga onwe-ya jekuru ya n'uzọ, si, Biko, ngwa, ka m'bakuru gi: n'ihi na ọ maghi na nwunye nwa-ya ka ọ bu. Tema we si, Gini ka i gēnyem, ka i we bakurum? 17 Ọ si, Mu onwem gēzitere gi nwa-ewu sitere n'ìgwè ewu na aturu. Tema we si, Ì gēnyem ihe-ibe, rue mb͕e i gēzite ya? 18 Ọ si, Gini bu ihe-ibe nke m'gēnye gi? Tema we si, Nb͕a-aka-akàrà-gi na eriri mma gi, na nkpa-n'aka-gi nke di n'aka-gi. Ọ chiri ha nye ya, we bakuru ya, o we turu ime n'aka-ya. 19 Tema we bilie, la, chipu ákwà-nkpudo-ya n'aru ya, yiri uwe ọnọdu nwayi di-ya nwuru nke ya. 20 Juda we zìe nwa-ewu ahu n'aka enyì-ya, bú onye Adulam, inara ihe-ibe ahu n'aka nwayi ahu: ma ọ chọtaghi ya. 21 O we jua ndikom nke ebe-ya, si, Òle ebe nwayi ahu edoro nsọ ikwa iko nọ, bú nwayi ahu nke nọduru n'Enaim n'uzọ? Ha si, Ọ dighi nwayi edoro nsọ ikwa iko nọworo n'ebe a. 22 Ọ we laghachikute Juda, si, Achọtaghm ya; ọzọ kwa, ndikom ebe ahu siri, Ọ dighi nwayi edoro nsọ ikwa iko nọworo n'ebe a. 23 Juda we si, Ka o were ya n'onwe-ya, ka ayi we ghara ighọ ihe ileda anya: le, ezigaram nwa-ewu a, ma gi onwe-gi achọtaghi ya. 24 O rue, mb͕e ihe ra ka ọnwa atọ gasiri, na egosiri Juda, si, Tema, bú nwunye nwa-gi, akwawo iko; ọzọ kwa, le, ọ di ime site n'ikwa-iko. Juda we si, Me ka ọ puta, ka esure ya ọku. 25 Mb͕e anēme ka nwayi ahu puta, ya onwe-ya zigara nna di-ya ozi, si, Site n'aka nwoke nke nwe ihe ndia ka mu onwem di ime: ọ si kwa, Biko, mata onye nwe ihe ndia, bú nb͕a-aka-akàrà, na eriri-nma, na nkpa-n'aka. 26 Juda we mata ha, ọ si, Ọ bu onye ezi omume kari mu onwem; n'ihi na eweghm ya nye Shila, bú nwam. Ma ọ maghi kwa ya ọzọ ma-ọli. 27 O rue na, nime mb͕e ọmumu-nwa-ya, le, umu abua di n'afọ-ya. 28 O rue, n'ọmumu-nwa-ya, na otù setipuru aka: nwayi nke nēle ime anya we were ogho uhie ke n aka-ya, si, Nka buru uzọ puta. 29 O rue na, ka ọ nēseghachi aka-ya, le, nwa-nne-ya nwoke putara: nwayi ahu we si, Gini mere i ji tiwara onwe-gi ntiwa? ewe kpọ aha-ya Perez. 30 Emesia nwa-nne-ya nwoke putara, bú nke nwere ogho uhie n'aka-ya: ewe kpọ aha-ya Zera.

Jenesis 39

1 Ma emere ka Josef ridata n'Ijipt: Potifa, onye nējere Fero ozi, onye-isi nke ndi-ob͕ū, bú nwoke Ijipt, we b͕a ya n'aka ndi Ishmael, ndi mere ya ka ọ ridata n'ebe ahu. 2 Jehova we nọyere Josef, ọ we buru nwoke ihe nāgara nke-ọma; ọ nọ n'ulo onye-nwe-ya, bú onye Ijipt ahu. 3 Onye-nwe-ya we hu na Jehova nọyere ya, ọ hu kwa na ihe nile nke ya nēme, Jehova nēme ka ọ ga nke-ọma n'aka-ya. 4 Josef we huta amara n'iru ya, we jere ya ozi: ọ me ya onye nēlekọta ulo-ya anya, ọ bu kwa ihe nile o nwere ka o tiyere n'aka-ya. 5 O rue, site na mb͕e o mere ya onye-nlekọta n'ulo-ya na onye nēlekọta ihe nile ọ nwere, na Jehova gọziri ulo onye Ijipt ahu n'ihi Josef; ngọzi Jehova we dikwasi ihe nile o nwere, n'ulo na n'ọhia. 6 O we rapu ihe nile o nwere n'aka Josef; ọ maghi kwa ihe ọ bula di n'aka ya, ma-ọbughi nání nri nke ya onwe-ya nēri. Josef makwara mma n'aru, ma kwa mma ile anya. 7 O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na nwunye nke onye-nwe-ya weliri anya-ya abua lekwasi Josef, si, Ka mu na gi dina. 8 Ma ọ juru, si nwunye nke onye-nwe-ya, Le, onye-nwem amaghi ihe di n'akam n'ulo, ọ bu kwa ihe nile o nwere ka o tiyeworo n'akam; 9 ọ dighi uku n'ulo a kari mu onwem; o b͕ochighi kwa ihe ọ bula n'ebe m'nọ ma-ọbughi nání gi, n'ihi na gi onwe-gi bu nwunye-ya: m'gēsi kwa aṅa me oké ihe ọjọ nka, mehie megide Chineke? 10 O rue, mb͕e ọ nāgwa Josef okwu kwa-ubọchi, na ọ geghi ya nti, idina nso ya, ma-ọbu inọyere ya. 11 O rue, dika ubọchi ahu, na ọ bara n'ulo ije ozi-ya; ma ọ dighi onye n'etiti ndikom nke ulo ahu nọ n'ebe ahu n'ulo. 12 Nwayi ahu we jide ya n'uwe-ya, si, Ka mu na gi dina; o we rapu uwe-ya n'aka-ya, b͕alaga, pua n'èzí. 13 O rue, mb͕e nwayi ahu huru na ọ rapururi uwe-ya n'aka-ya, b͕apu n'èzí, 14 na ọ kpọrọ ndikom ulo-ya, gwa ha okwu, si, Lenu, o mewo ka nwoke. Hibru bakute ayi ikwa ayi emò; ọ bakuterem idina-yerem, m'we kpọ nkpu n'oké olu: 15 o rue, mb͕e ọ nuru na ewelirim olum kpọ nkpu, na ọ rapuru uwe-ya n'ebe m'nọ, b͕alaga, pua n'èzí. 16 Nwayi ahu we debe uwe-ya n'ebe ọ nọ, rue mb͕e onye-nwe-ya batara n'ulo-ya. 17 Ọ we gwa ya dika okwu ndia si di, si, Orù Hibru ahu, nke i meworo ka ọ bakute ayi, bakuterem ikwam emò: 18 ma o rue, mb͕e m'weliri olum kpọ nkpu, na ọ rapuru uwe-ya n'ebe m'nọ, b͕apu n'ezí. 19 O rue, mb͕e onye-nwe-ya nuru okwu nile nke nwunye-ya, nke ọ gwara ya, si, Dika ihe ndia si di ka orù-gi merem; na iwe-ya di ọku. 20 Onye-nwe Josef we kuru ya, tiye ya n'ulo-nkpọrọ, bú ebe ndi-nkpọrọ nke eze Ijipt nọ n'ab͕u: o we nọ n'ebe ahu n'ulo-nkpọrọ. 21 Ma Jehova nọyere Josef, me ka ebere-Ya rue ya aru, O nye ya amara n'iru onye-isi ulo-nkpọrọ ahu. 22 Onye-isi ulo-nkpọrọ ahu we tiye n'aka Josef ndi-nkpọrọ nile ndi nọ n'ulo-nkpọrọ ahu; ihe ọ bula ha nēme kwa n'ebe ahu, ya onwe-ya bu onye nēme ya. 23 Ọ dighi ihe ọ bula onye-isi ulo-nkpọrọ ahu nāhu nke di n'aka-ya, n'ihi na Jehova nọyere ya; ihe nke ya onwe-ya nēme, Jehova mere ka ọ ga nke-ọma.

Jenesis 40

1 O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na obu-ihe-ọṅuṅu nke eze Ijipt na osi-ite-ya mehiere megide onye-nwe-ha, bú eze Ijipt. 2 Fero we we iwe megide madu abua ahu nējere ya ozi, megide onye-isi-ndi-obu-ihe-ọṅuṅu, megide kwa onye-isi ndi-osi-ite. 3 Ọ we tiye ha n'ebe anēdebe ndi-nkpọrọ n'ulo onye-isi ndi-ob͕ū, nime ulo-nkpọrọ, bú ebe Josef nọ n'ab͕u. 4 Onye-isi ndi-ob͕ū we me ka Josef nēlekọta ha anya, ọ we jere ha ozi: ha nọ ubọchi ufọdu n'ebe anēdebe ndi-nkpọrọ. 5 Ha we rọ nrọ, ha abua, onye ọ bula ọ rọ nrọ-ya n'otù abali ahu, onye ọ bula dika akukọ-isi nrọ-ya si di, bú obu-ihe-ọṅuṅu na osi-ite eze Ijipt nwere, ndi nọ n'ab͕u n'ulo-nkpọrọ. 6 Josef we bakute ha n'ututu, hu ha, ma, le, iru nāb͕aru ha. 7 Ọ we jua ndi ahu nējere Fero ozi, ndi nọyere ya n'ebe anēdebe ndi-nkpọrọ n'ulo onye-nwe-ya, si, Gini mere iru-unu ji jọ njọ taa? 8 Ha si ya, Nrọ ka ayi rọworo, ọ dighi kwa onye nākọ isi-ya. Josef we si ha, Ọ̀ bughi Chineke nwe akukọ-isi nrọ nile? biko, kọrọnu m. 9 Onye-isi ndi-obu-ihe-ọṅuṅu ahu we kọrọ Josef nrọ-ya, si ya, Na nrọm, le, osisi vine di n'irum. 10 alaka atọ di kwa n'osisi vine ahu: vine ahu we di ka ọ nāma ifuru, okoko-ya nile b͕ọwara; uyọkọ-ya nile miri nkpuru-vine chara acha: 11 iko Fero di kwa n'akam; m'were nkpuru-vine ahu, pinye ha n'iko Fero, nye iko ahu n'aka Fero. 12 Josef we si ya, Nka bu akukọ-isi-ya: alaka atọ ahu, ubọchi atọ ka ha bu; 13 ọ fọduru ubọchi atọ Fero gēweli isi-gi, me ka i lata n'ọnọdu-gi: i gēnye kwa iko Fero n'aka-ya, dika i nēme na mbu mb͕e i buri obu-ihe-ọṅuṅu-ya. 14 Ma otú ọ di chetam n'onwe-gi mb͕e ọ gādiri gi nma, mekwara m ebere, biko, chetakwa m n'iru Fero, me ka m'si n'ulo a pua: 15 n'ihi na ezupurum n'ala ndi-Hibru n'ezie: ọzọ kwa, n'ebe a emeghm ihe ọ bula ka ha we tinye m n'olùlù a. 16 Onye-isi ndi-osi-ite we hu na akukọ-isi nrọ a di nma, ọ we si Josef, Mu onwem di kwa na nrọm, ma, le, nkata atọ nke achicha ọcha di n'isim: 17 ufọdu nime ihe-oriri nile nke Fero nke osi ite nēsi di kwa na nkata nke kachasi elu; anu-ufe nēri kwa ha site na nkata ahu n'elu isim. 18 Josef we za, si, Nka bu akukọ-isi-ya: nkata atọ ahu, ubọchi atọ ka ha bu; 19 ọ fọduru ubọchi atọ Fero gēweli isi-gi wepu ya n'aru gi, kwuba gi n'elu osisi; anu-ufe gēri kwa anu-aru-gi site n'aru gi. 20 O rue, n'ubọchi nke-atọ, nke bu ubọchi ncheta ọmumu Fero, na o mere oké oriri nye ndi-orù-ya nile: o welie isi onye-isi ndi-obu-ihe-ọṅuṅu na isi onye-isi ndi-osi-ite n'etiti ndi-orù-ya. 21 O me ka onye-isi ndi-obu-ihe-ọṅuṅu lata n'ọnọdu-obu-ihe-ọṅuṅu-ya; o we nye iko n'aka Fero: 22 ma ọ kwubara onye-isi ndi-osi-ite: dika Josef kọrọ isi nrọ nye ha. 23 Ma onye-isi ndi-obu-ihe-ọṅuṅu echetaghi Josef, kama o chezọrọ ya.

Jenesis 41

1 O rue, n'ọgwugwu ogologo arọ abua, na Fero nārọ nrọ: ma, le, o nēguzo n'akuku osimiri Nail. 2 Ma, le, ehi asa nēsi n'osimiri Nail rigoputa, ha mara nma ile anya ma kwa abuba n'anu-aru-ha; ha we nāta nri n'etiti ubi. 3 Ma, le, ehi asa ọzọ nēsi n'osimiri Nail rigoputa n'azu ha, ha jọrọ njọ ile anya, ta kwa aru n'anu-aru-ha; ha we guzo nso ehi asa ọzọ ahu n'usọ osimiri Nail. 4 Ehi ahu ndi jọrọ njọ ile anya, ndi takwara aru n'anu-aru-ha, we rie ehi asa ahu mara nma ile anya ma kwa abuba. Fero we teta. 5 O we raru ura rọ nrọ nke ub͕ò abua: ma, le, oko ọka asa nāwaputa n'otù ókpòrò, ha buru ibu di kwa nma. 6 Ma, le, oko ọka asa, nke fikpọrọ afikpọ, nke ifufe Iru-anyanwu chakpọkwara achakpọ, nēpuso ha n'azu. 7 Oko ọka asa nke fikpọrọ afikpọ we loda oko ọka asa ahu nke buru ibu so kwa nkpuru. Fero we teta, ma, le, ọ bu nrọ. 8 O rue, n'ututu, na mọ-ya b͕asasiri; o we ziga kpọ ndi-ode-akwukwọ di nsọ nile nke Ijipt, na ndi-ya nile mara ihe: Fero we kọrọ ha nrọ-ya; ma ọ dighi onye nākọrọ Fero isi-ha. 9 Onye-isi ndi-obu-ihe-ọṅuṅu we gwa Fero okwu, si, Nmehiem nile ka mu onwem nēhota ta: 10 Fero were iwe n'aru ndi-orù-ya, tinye m n'ebe anēdebe ndi-nkpọrọ n'ulo onye-isi ndi-ob͕ū, mu na onye-isi ndi osi ite: 11 ayi we rọ nrọ n'otù abali, mu na ya; onye ọ bula dika akukọ-isi nrọ-ya si di, otú a ka ayi rọrọ. 12 Ma ayi na otù okorọbia nọ n'ebe ahu, bú onye-Hibru, orù onye-isi nke ndi-ob͕ū nwere; ayi we kọrọ ya, ọ we kọrọ ayi isi nrọ-ayi; onye ọ bula n'etiti ayi dika nrọ-ya si di ka ọ kọrọ isi nrọ nye. 13 O rue na, dika ọ kọrọ isi nrọ nye ayi, otú a ka ọ di; mu ka ọ mere ka m'lata n'ọnọdum, ma ya ka ọ kwugburu. 14 Fero we ziga kpọ Josef, ha we me ka o si n'olùlù ahu b͕aputa: ọ kọpu isi-ya, b͕anwe uwe-nb͕okwasi-ya nile, bakute Fero. 15 Fero we si Josef, Nrọ ka m'rọworo, ọ dighi kwa onye nākọ isi-ya: ma mu onwem anuwo okwu bayere gi, si, na i nānu nrọ ikọ isi-ya. 16 Josef we za Fero, si, Ọ dighm n'aka: Chineke gāza aziza udo nye Fero. 17 Fero we gwa Josef okwu, si, Na nrọm, le, m'nēguzo n'usọ osimiri Nail: 18 ma, le, ehi asa nēsi n'osimiri Nail rigoputa, ha mara abuba n'anu-aru-ha, ma kwa nma n'aru; ha we ta nri n'etiti ubi: 19 ma, le, ehi asa ọzọ nārigoputa n'azu ha, ha adighi nma, jọ njọ n'aru nke-uku, ta kwa aru n'anu-aru-ha, ahughm otú ndi ahu n'ijọ-njọ n'ala Ijipt nile: 20 ehi ahu ndi tara aru, ndi, jọkwara njọ, we rie ehi asa mbu mara abuba: 21 ma mb͕e ha basiri n'afọ-ha, amaghi na ha barari n'afọ-ha; ma ha jọrọ njọ ile anya, dika na nmalite. M'we teta. 22 M'we hu na nrọm, ma, le, oko ọka asa nāwaputa n'otù ókpòrò, ha soro nkpuru, di kwa nma: 23 ma, le, oko ọka asa, nke kpọnwuru akpọnwu, nke fikpọ-kwa-ra afikpọ, nke ifufe Iru-anyanwu chakpọ-kwa-ra, nēpuso ha n'azu: 24 oko ọka asa ahu nke fikpọrọ afikpọ we loda okọ ọka asa ahu di nma: m'we gwa ndi-ode-akwukwọ di nsọ; ma ọ dighi onye nēgosim ya. 25 Josef we si Fero, Nrọ, Fero, otù ka ọ bu: ihe nke Chineke gaje ime, nke ahu ka O gosiworo Fero. 26 Ezi ehi asa ahu, arọ asa ka ha bu; ezi oko ọka asa ahu, arọ asa ka ha bu kwa: nrọ ahu, otù ka ọ bu. 27 Ehi asa ahu nke tara aru, nke jọ-kwa-ra njọ, nke nārigoputa n'azu ha, arọ̄ asa ka ha bu, ha na oko ọka asa ahu nke di efù, nke ifufe Iru-anyanwu chakpọrọ; ha gābu arọ asa nke oké unwu. 28 Nke ahu bu okwu nke m'gwara Fero: ihe nke Chineke gaje ime, nke ahu ka Ọ mere ka Fero hu anya. 29 Le, arọ asa nābia nke aganēriju afọ nke-uku n'ala Ijipt nile: 30 arọ asa nke oké unwu gēbili kwa ma ndia gasia; agēchezọ kwa iriju-afọ nile n'ala Ijipt; oké unwu ahu gēb͕upia ala ahu; 31 agaghi-ama iriju-afọ ahu n'ala nka n'ihi oké unwu ahu nke nēso ya; n'ihi na arọ́ ka ọ gādi nke-uku. 32 Ma ihe kpatara eji me ka nrọ ahu di okpukpu abua nye Fero, ọ bu n'ihi na emewo ka okwu ahu guzosie ike site n'ebe Chineke nọ, Chineke nēme kwa ngwa ime ya. 33 Ma ub͕u a, ka Fero leputa nwoke nwere nghọta, nke ma-kwa-ra ihe, ka o do kwa ya onye-isi ala Ijipt nile. 34 Ka Fero me nka, me kwa ka ndi-nlekọta ala nka, ka ọ were kwa otù uzọ n'uzọ ise nke ala Ijipt n'arọ asa ahu anēriju afọ. 35 Ka ha chikọta kwa ihe-oriri nile nke ezi arọ ndia nke nābia, ka ha kwakọba kwa ọka n'okpuru aka Fero ibu ihe-oriri n'obodo Ijipt nile, ka ha debe kwa ya. 36 Ihe-oriri ahu gābu ihe agēdebere ala nka rue arọ asa nke oké unwu ahu nke gādi n'ala Ijipt; ka ewe ghara ibipu ala nka n'oké unwu ahu. 37 Ihe ahu di nma n'anya Fero, na n'anya ndi-orù-ya nile. 38 Fero we si ndi-orù-ya, Àyi gāchọta madu dika onye a, bú nwoke nke mọ Chineke di nime ya? 39 Fero we si Josef, Ebe Chineke meworo gi ka i mara ihe a nile, ọ dighi onye nwere nghọta, nke ma-kwa-ra ihe, dika gi: 40 gi onwe-gi gābu onye-isi ulom, ọ bu kwa n'okwu ọnu-gi ka ndim nile gēdo onwe-ha n'usoro: nání n'oche-eze ka m'gādi uku kari gi, 41 Fero we si Josef, Le, edowom i onye-isi ala Ijipt nile. 42 Fero we b͕upu nb͕a-aka-akàrà n'aka-ya, b͕aye ya n'aka Josef, yibe ya uwe nke ezi ákwà ọcha, tukwasi iyab͕a ọla-edo n'olu-ya, 43 me ka o were ub͕ọ-ala nke-abua o nwere nāga-ghari; ha we kpọ nkpu n'iru ya, si, B͕u ikpere n'ala: o we do ya onye-isi ala Ijipt nile. 44 Fero we si Josef, Mu onwem bu Fero, asi kwa na i nọghi ya ọ dighi onye ọ bula gēweli aka-ya ma-ọbu ukwu-ya n'ala Ijipt nile. 45 Fero we kpọ aha Josef Zafenat-pania; o nye ya Asenat, bú nwa-nwayi Poti-fera onye-nchu-àjà nke On, na nwunye. Josef we pua jeghari n'ala Ijipt. 46 Josef b͕ara orú arọ na iri mb͕e o guzoro n'iru Fero eze Ijipt. Josef we si n'iru Fero pua, gabiga n'ala Ijipt nile. 47 N'arọ asa ahu nke anēriju afọ ala we nēme nri ri nne. 48 O we chikọta ihe-oriri nile nke arọ asa ahu nke di n'ala Ijipt, tiye ihe-oriri ahu n'obodo nile: ihe-oriri nke ubi nke obodo ọ bula nke di ya gburugburu ka o tiyere n'etiti ya. 49 Josef we kwakọba ọka dika ájá nke oké osimiri, nēme ka ọ ba uba nke-uku, rue mb͕e ọ rapuru igu ya ọnu; n'ihi na ọ dighi nguta. 50 Amuru umu-ndikom abua nye Josef tutu arọ oké unwu abia, ndi Asenat nwa-nwayi Poti-fera, bú onye-nchu-àjà nke On, muru nye ya. 51 Josef we kpọ aha ọkpara-ya Manase: si, N'ihi na Chineke emewom ka m'chezọ ndọb͕u nile m'dọb͕uru onwem n'ọlu na ulo nile nke nnam. 52 Aha nke-abua ka ọ kpọrọ Efraim: si, N'ihi na Chineke emewom ka m'mua ọmùmù n'ala ewedaram ala. 53 Arọ asa ahu nke nriju-afọ, nke di n'ala Ijipt, we gwu. 54 Arọ asa ahu nke oké unwu we malite ibia, dika Josef siri; oké unwu we di n'ala nile; ma nri di n'ala Ijipt nile. 55 Agu we nāgu ala Ijipt nile, ndi ala ahu we tikue Fero inye ha nri: Fero we si ndi Ijipt nile, Jekurunu Josef, ihe ọ si unu me, menu ya. 56 Oké unwu ahu we dikwasi n'elu uwa nile: Josef we meghe ebe nile nke ọka di nime ha, ọ we re ọka nye ndi Ijipt; oké unwu ahu we sie ike n'ala Ijipt. 57 Ma uwa nile biaruru Ijipt, biakute Josef, izuru ọka; n'ihi na oké unwu ahu siri ike n'uwa nile.

Jenesis 42

1 Jekob we hu na ọka di n'Ijipt, Jekob we si umu-ya ndikom, N'ìhi gini ka unu nēlerita onwe-unu anya? 2 Ọ si kwa, Le, anuwom na ọka di n'Ijipt: ridanu n'ebe ahu, si n'ebe ahu zutara ayi; ka ayi we di ndu, ghara inwu anwu. 3 Umu-nne Josef iri we rida isi n'Ijipt zuta ọka. 4 Ma Benjamin, bú nwa-nne Josef, ka Jekob nēzigaghi ka ya na umu-nne-ya yikọ je; n'ihi na ọ siri, Ka ajọ ihe we ghara idakwasi ya. 5 Umu Israel we bia izuru ọka n'etiti ndi nābia: n'ihi na oké unwu ahu di n'ala Kenean. 6 Ma Josef, ya onwe-ya bu onye-isi ala ahu: ya onwe-ya bu onye nēre ọka nye ndi ala ahu nile: umu-nne Josef we bia, kpọ isi ala nye ya, kpuchie iru-ha n'ala. 7 Josef we hu umu-nne-ya, ọ mata ha, ma ọ mere onwe-ya dika onye ala ọzọ n'ebe ha nọ, ọ we kpayere ha uka ike, si ha, Òle ebe unu si bia? Ha si, Site n'ala Kenean izuru ihe-oriri. 8 Josef we mata umu-nne-ya, ma ha onwe-ha amataghi ya. 9 Josef we cheta nrọ abua ahu nke ọ rọrọ bayere ha, ọ si ha, Ndi-nledo ka unu bu; ihu ọb͕ub͕a-ọtọ ala ka unu biaworo. 10 Ha si ya, É-è, onye-nwem, kama ndi-orù-gi abiawo izuru ihe-oriri. 11 Ayi nile, umu otù nwoke ka ayi bu, ndi ziri ezi ka ayi bu, ndi-orù-gi abughi ndi-nledo. 12 Ọ si ha, É-è, kama ọ bu ọb͕ub͕a-ọtọ ala ka unu biaworo ihu. 13 Ha si, Ayi onwe-ayi ndi-orù-gi bu umu-nne iri na abua, umu nke otù nwoke n'ala Kenean; ma, le, nke-ntà di n'aka nna-ayi ta, ma otù nke fọduru anọghi ndu. 14 Josef we si ha, Nke ahu bu ihe m'gwara unu, si, Ndi-nledo ka unu bu: 15 nime nka ka agānwaputa unu: Fero di ndu! unu agaghi-esi n'ebe a pua ma-ọli, ma ọ buru na nwa-nne-unu nke-ntà abiaghi n'ebe a. 16 Ziganu otù nime unu, ya kute nwa-nne-unu; ma unu onwe-unu, ka eke unu ab͕u, ka ewe nwaputa okwu nile unu, ma ezi-okwu di nime unu: ma ọ buru na ọ dighi otú a, Fero di ndu! ndi-nledo ka unu bu n'ezie. 17 Ọ we chikọta ha tiye n'ebe anēdebe ndi-nkpọrọ ubọchi atọ. 18 Josef we si ha n'ubọchi nke-atọ, Menu nka, di-kwa-nu ndu; n'ihi na Chineke ka mu onwem nātu egwu: 19 ọ buru na ndi ziri ezi ka unu bu, ka eke otù nwa-nne-unu ab͕u n'ulo ebe anēdebe unu; ma unu onwe-unu, jenu, burunu ọka la n'ihi oké unwu nke ulo-unu: 20 ma nwa-nne-unu nke-ntà ka unu gēme ka ọ biakutem; agēgosi kwa na okwu nile unu bu ezi-okwu, unu agaghi-anwu kwa. Ha we me otú a. 21 Ha we sirita onwe-ha, N'ezie ndi ikpe maworo bayere nwa-nne-ayi ka ayi bu, n'ihi na ayi huru nkpab͕u nke nkpuru-obi-ya, mb͕e ọ nāriọ ayi aririọ-amara, ma ayi anughi; n'ihi ya ka nkpab͕u a biakwasiworo ayi. 22 Reuben we za ha, si, Agwaghi m unu okwu, si, Unu emehiela megide nwa ahu; ma unu anughi? ọzọ kwa, ọbara-ya, le, anājuta ya. 23 Ma ha onwe-ha amaghi na Josef nānu ihe ha nēkwu; n'ihi na onye-nsughari nọ n'etiti ha. 24 O we si n'ebe ha nọ chighari onwe-ya, kwa, ákwá; o we laghachikute ha, gwa ha okwu, si n'etiti kuru Simeon, ke ya ab͕u n'iru anya-ha. 25 Josef we nye iwu, ha we kpojue ihe nile ha n'ọka, o nye kwa iwu inyeghachi ego-ha, nke onye ọ bula n'akpa-ya, na inye ha ihe ha gēri n'uzọ: ewe mere ha otú a. 26 Ha were ọka-ha bo inyinya-ibu-ha, si n'ebe ahu la. 27 Otù nime ha we meghe akpa-ya inye inyinya-ibu-ya nri-anu-ulo n'ebe inọ ọnọdu-abali, ọ we hu ego-ya; ma, le, ego ahu di n'ọnu akpa-ya. 28 Ọ si umu-nne-ya, Enyeghachiwo egom; ọzọ kwa, le, ọ di n'akpam: obi-ha we fepu, ha we nāmarita jijiji n'etiti onwe-ha, si, Gini bu nka Chineke meworo ayi? 29 Ha we biakute Jekob nna-ha, rue ala Kenean, gosi ya ihe nile dakwasiri ha; si, 30 Nwoke ahu, bú onye-nwe ala ahu, kpayere ayi uka ike, tiye ayi n'ebe anēdebe ndi-nkpọrọ dika ndi-nledo ala. 31 Ayi we si ya, Ndi ziri ezi ka ayi bu, ayi abughi ndi-nledo: 32 umu-nne iri na abua ka ayi bu, umu nke nna-ayi; otù anọghi ndu, nke-ntà di kwa n'aka nna-ayi taa n'ala Kenean. 33 Nwoke ahu, bú onye-nwe ala ahu, we si ayi, Nime nka ka m'gāmara na ndi ziri ezi ka unu bu: kwenu ka otù nwa-nne-unu nọdu n'akam, ma werenu ọka n'ihi oké unwu nke ulo-unu, la: 34 ma menu ka nwa-nne-unu nke-ntà biakute m: ka m'mara kwa na ọ dighi ndi-nledo unu bu, kama unu bu ndi ziri ezi: nwa-nne-unu ka m'gēnye unu, ọ bu kwa n'ala nka ka unu gāzu ahia. 35 O rue na, mb͕e ha nāwupu ihe di n'akpa-ha, le, ngwungwu ego nwoke ọ bula di n'akpa-ya: ha we hu ngwugwu ego-ha, ha onwe-ha na nna-ha, ha we tua egwu. 36 Jekob nna-ha we si ha, Mu ka unu b͕abaworo aka umu: Josef anọghi ndu, Simeon anọghi kwa ndu, ọ bu kwa Benjamin ka unu gēkuru: mu ka ihe ndia nile biakwasiworo. 37 Reuben we gwa nna-ya okwu, si, Umum ndikom abua ka i gēme ka ha nwua, ma ọ buru na emeghi m ka ọ biakute gi: nye ya n'akam, mu onwem gēme kwa ka ọ laghachikute gi. 38 Ọ si, Nwam agaghi-eso unu rida; n'ihi na nwa-nne-ya anwuwo, ya onwe-ya, nání ya, fọdukwara: asi na ajọ ihe adakwasi ya n'uzọ nke unu nēje na ya, unu gēweda kwa isi-awọm rue ala-mọ na nwuta.

Jenesis 43

1 Oké unwu ahu we sie ike n'ala ahu. 2 O rue, mb͕e ha risiri ọka nke ha siri n'Ijipt bute, na nna-ha siri ha, Jeghachinu, zutara ayi nwanti ihe-oriri. 3 Juda we gwa ya okwu, si, Nwoke ahu b͕asiri ayi àmà ike, si, Unu agaghi-ahu irum, ma ọ buru na nwa-nne-unu esoghi unu bia. 4 Ọ buru na i nēziga nwa-nne-ayi, ka ayi na ya we yikọ je, ayi gārida, zutakwara gi ihe-oriri: 5 ma ọ buru na i gaghi-eziga ya, ayi agaghi-arida: n'ihi na nwoke ahu siri ayi, Unu agaghi-ahu irum, ma ọ buru na unu na nwa-nne-unu ayikọghi bia. 6 Israel we si, N'ìhi gini ka unu mejọrọm, n'igosi nwoke ahu na unu nwere nwa-nne ọzọ? 7 Ha si, Nwoke ahu jusiri ajuju ike banyere ayi, banyekwara umu-nna-ayi, si, Nna-unu, ọ̀ nọ ndu ub͕u a? ọ̀ di nwa-nne-ọzọ unu nwere? ayi we gosi ya dika okwu ndia si di: àyi gāmara n'ezie na ọ gāsi, Menu ka nwa-nne-unu ridata? 8 Juda we si Israel nna-ya, Ziga nwa-okoro ahu ka mu na ya we yikọ je, ayi gēbili kwa, je; ka ayi we di ndu, ghara inwu, ma ayi, ma gi, ma umu-ntakiri-ayi. 9 Mu onwem gānọrọ ya mbe; n'akam ka i gājuta ya: ọ buru na emeghm ka ọ biakute gi, ọ buru kwa na akpotaghi m ya n'iru gi, emehiewokwam megide gi ubọchi ndum nile: 10 n'ihi na asi na ayi anọghi ọdù, n'ezie ayi gālatawori ub͕ò abua ndia. 11 Israel, bú nna-ha, we si ha, Ọ buru na ọ di otú a ub͕u a, menu nka; werenu ufọdu nime ihe makarisiri mma nke ala nka n'ihe-unu, wedakwara nwoke ahu onyinye-inata-iru-ọma, nwantī balm, na nwantī manu-aṅu, na uda di iche iche, na myrrh, na ákú, na almond: 12 were-kwa-nu ego okpukpu abua n'aka-unu: ego kwa nke enyegha-chiri n'ọnu akpa-unu, weghachinu ya n'aka-unu; eleghi anya ohihie-anya ka ọ bu: 13 kuru-kwa-nu nwa-nne-unu, bilie, jeghachikuru nwoke ahu: 14 Chineke Nke puru ime ihe nile, Ya nye kwa unu obi-ebere n'iru nwoke ahu, ka ọ we zitere unu nwa-nne-unu nke-ọzọ na Benjamin. Ma mu onwem, ọ buru na ab͕abaram aka umu, ab͕abawom aka umu. 15 Ndikom ahu we were onyinye-inata-iru-ọma ahu, ọ bu kwa okpukpu ego abua ka ha were n'aka-ha, na Benjamin; ha bilie, rida n'Ijipt, guzo n'iru Josef. 16 Josef we hu Benjamin n'etiti ha, ọ si onye bu onye-isi ulo-ya, Me ka ndikom ahu bata n'ulo, gi b͕u kwa anu, dozie ihe; n'ihi na mu ka ndikom ahu gēso ri ihe n'etiti-ehihie. 17 Nwoke ahu we me dika Josef siri ya; nwoke ahu we me ka ndikom ahu bata n'ulo Josef. 18 Ndikom ahu we tua egwu, n'ihi na emere ka ha bata n'ulo Josef; ha si, Ọ bu n'ihi ego ahu, nke enyeghachiri n'akpa-ayi na mmalite, ka anēme ka ayi onwe-ayi bata; ka ọ we chọ ayi okwu, dakwasi ayi, were ayi ibu ndi-orù, were kwa inyinya-ibu-ayi. 19 Ha we biakute nwoke ahu nso, nke bu onye-isi ulo Josef, ha gwa ya okwu n'ọnu-uzọ ulo ahu, 20 si, Biko, onye-nwem, ayi rida-tara n'ezie na nmalite izuru ihe-oriri: 21 o rue, mb͕e ayi biara n'ebe inọ ọnọdu-abali, na ayi meghere akpa-ayi, ma, le, ego onye ọ bula di n'ọnu akpa-ya, bú ego-ayi n'ọtùtù-ya zuru okè; ayi ewe-ghachiwo ya n'aka-ayi. 22 Ọ di kwa ego ọzọ ayi wedataworo n'aka-ayi izuru ihe-oriri: ayi amaghi onye tiyere ego-ayi n'akpa-ayi. 23 Ọ si Udo diri unu, unu atula egwu: Chineke-unu, na Chineke nke nna-unu, enyewo unu àkù zoro ezo n'akpa-unu: ego-unu rurum aka. Ọ me ka Simeon pukute ha. 24 Nwoke ahu we me ka ndikom ahu bata n'ulo Josef, ọ nye ha miri, ha we sa ukwu-ha; ọ nye kwa inyinya-ibu nile ha nri-anu-ulo. 25 Ha we dozie onyinye-inata-iru-ọma ahu rue ọbibia Josef n'etiti-ehihie: n'ihi na ha nuru na ọ bu n'ebe ahu ka ha gēri nri. 26 Josef we bata n'ulo-ya, ha we webatara ya onyinye-inata-iru-ọma ahu nke di n'aka-ha nime ulo, kpọ isi ala nye ya. 27 Ọ jua ha ajuju bayere udo-ha, si, Ọ̀ nọ n'udo, bú nna-unu, agadi ahu onye unu kwuru okwu bayere ya? Ọ̀ nọ kwa ndu? 28 Ha si, Orù-gi, bú nna-ayi, nọ n'udo, ọ nọ kwa ndu. Ha we rube isi, kpọ isi ala. 29 Ọ welie anya-ya abua, hu Benjamin nwa-nne-ya, bú nwa nke nne-ya, ọ si Ọ̀ bu nka bu nwa-nne-unu nke-ntà, onye unu gwaram okwu banyere ya? Ọ we si, Ka Chineke mere gi amara, nwam. 30 Josef we me ngwa; n'ihi na obi-ebere-ya nile di ọku n'aru nwa-nne-ya: ọ chọ ebe ọ gākwa ákwá; o we ba n'ime-ulo-ya, kwa ákwá n'ebe ahu. 31 Ọ sa iru-ya, puta, jisie onwe-ya ike, si, Dọkwasinu nri. 32 Ha we dọkwasiri ya nke ya iche, dọkwasikwara ha nke ha iche, dọkwasi-kwa-ra ndi Ijipt nke ha iche, bú ndi ya na ha nērikọ ihe: n'ihi na ndi Ijipt apughi isoro ndi-Hibru rie nri; n'ihi na ihe-árú ka nke ahu buru ndi Ijipt. 33 Ha we nọdu n'iru ya, ọkpara dika ọnọdu-ọkpara-ya si di, nke-ntà kwa dika ọnọdu-nke-ntà-ya si di; ibobo we nwurita ndikom ahu n'aru n'etiti ibe-ha. 34 Ewe si n'iru ya butere ha onyinye nri: ma onyinye nri Benjamin kariri onyinye nri ha nile ub͕o ise. Ha we so ya ṅu ihe-ọṅuṅu, we ṅujue afọ.

Jenesis 44

1 Ọ we nye onye bu onye-isi ulo-ya iwu, si, Kpojue akpa ndikom ahu n'ihe-oriri, otú ha puru ibu, tinye kwa ego onye ọ bula n'ọnu akpa-ya. 2 Tiye kwa ọkwam, bú ọkwa ọla-ọcha, n'ọnu akpa onye nke-ntà, ya na ego ọka-ya. Ọ we me dika okwu Josef si di, nke o kwuru. 3 Mb͕e ìhè ututu putara, ewe zilaga ndikom ahu, ha na inyinya-ibu-ha. 4 Ndi ahu siri n'obodo pua, ha erughi n'ebe di anya, ma Josef siri onye bu onye-isi ulo-ya, Bilie, chua ndikom ahu; mb͕e i ruru ha aru i gāsi ha, N'ìhi gini ka unu were ihe ọjọ kwughachi n'ọnọdu ezi ihe? 5 Ọ̀ bughi nka bu ihe onye-nwem ji aṅu ihe-ọṅuṅu, ya onwe-ya ji kwa ya ariba ama n'ezie? unu emewo ihe ọjọ n'ihe nke unu mere. 6 Ọ we rue ha aru, gwa ha okwu ndia. 7 Ha si ya, N'ìhi gini ka onye-nwem nēkwu okwu dika okwu ndia? Ya buru ndi-orú-gi ihe-árú ime ihe dika ihe a. 8 Le, ego nke ayi hutara n'ọnu akpa-ayi, ayi si n'ala Kenean weghachiri gi ya: àyi gēsi kwa aṅa si n'ulo onye-nwe-gi zuru ọla-ọcha ma-ọbu ọla-edo? 9 Onye ọ bula n'etiti ndi-orù-gi agāchọta ya n'aka-ya, ya nwua, ọzọ kwa, ayi onwe-ayi gāghọrọ onye-nwem ndi-orù. 10 Ọ si, Ub͕u a kwa, dika okwu nile unu si di, otú a ka ọ gādi: onye agāchọta ya n'aka-ya gāburum orù; ma unu onwe-unu gābu ndi puru ya. 11 Ha we me ngwa, weda akpa-ha, onye ọ bula akpa nke ya, ha meghe akpa-ha, onye ọ bula akpa nke ya. 12 Ọ we chọsie ike, n'okenye ka ọ malitere, ọ bu kwa na nke-ntà ka ọ chọbiri: ewe chọta ọkwa ahu n'akpa Benjamin. 13 Ha we dọwa uwe-nb͕okwasi-ha, onye ọ bula o bo inyinya-ibu-ya ibu, ha we laghachi n'obodo. 14 Juda na umu-nne-ya we ba n'ulo Josef; ma ya onwe-ya nọ kwa n'ebe ahu rue mb͕e ahu: ha we da n'ala n'iru ya. 15 Josef we si ha, Òmume gini bu nka nke unu meworo? ùnu amaghi na nwoke nke di kam nāriba ama n'ezie? 16 Juda we si, Gini ka ayi gāsi onye-nwem? gini ka ayi gēkwu? àyi gēsi kwa aṅa gu onwe-ayi na ndi ezi omume? Chineke achọputawo ajọ omume ndi-orù-gi: le, ayi aghọworo onye-nwem ndi-orù, ma ayi onwe-ayi ma onye ahu nke achọta-woro ọkwa ahu n'aka-ya. 17 Ọ si, Ya burum ihe-árú ime nka: nwoke ahu achọtaworo ọkwa ahu n'aka-ya, ọnye ahu gāghọrọm orù; ma unu onwe-unu, rigo-kurunu nna-unu n'udo. 18 Juda we biakute ya nso, si, Biko, onye-nwe m, biko, ka orù-gi kwue okwu na nti onye-nwe m, iwe-gi adi-kwa-la ọku n'aru orù-gi: n'ihi na otú i di, otú ahu ka Fero di kwa. 19 Onye-nwem juru ndi-orù-ya, si, Ùnu nwere nna ma-ọbu nwa-nne? 20 Ayi we si onye-nwem, Ayi nwere nna, bú agadi, na otù nwa agadi-ya, bú onye ntà; nwa-nne-ya anwuruwo kwa, ọ we fọdu nwata ahu nání ya nye nne-ya, nna-ya hukwara ya n'anya. 21 I we si ndi-orù-gi, Me ka ọ ridakutem, ka m'we tukwasi anyam n'aru ya. 22 Ayi we si onye-nwem, Nwa-okoro ahu apughi irapu nna-ya: asi kwa na ọ rapu nna-ya, nna-ya gānwu. 23 I we si ndi-orù-gi, Ọ buru na nwa-nne-unu nke-ntà esoghi unu ridata, unu agaghi-ahu irum ọzọ ma-ọli. 24 O rue, mb͕e ayi rigokuru orù-gi, bú nnam, na ayi gosiri ya okwu nile nke onye-nwem. 25 Nna-ayi we si, Jeghachinu, zutara ayi nwantī ihe-oriri. 26 Ayi we si, Ayi apughi irida: ọ buru na nwa-nne-ayi nke-ntà eso ayi je, ayi gārida kwa; n'ihi na ayi apughi ihu iru nwoke ahu, ma ọ buru na nwa-nne-ayi nke-ntà esoghi ayi je. 27 Orù-gi, bú nnam, we si ayi, Unu onwe-unu mara na umu-ndikom abua ka nwunyem muru nyem: 28 otù nime ha we si n'ebe m'nọ pua, m'we si, N'ezie anu-ọhia adọb͕usiwo ya; ahughi-kwam ya rue ub͕u a: 29 ma ọ buru na unu ekupu kwa nka n'irum, ajọ ihe adakwasi kwa ya, unu gēweda isi-awọm rue ala-mọ n'ihe ọjọ. 30 Ma ub͕u a, mb͕e m'gābiakute orù-gi, bú nnam, ma nwa-okoro ahu esoghi ayi bia; ebe ekekọtara nkpuru-obi-ya na nkpuru-obi nwa-okoro ahu; 31 o gēru kwa, mb͕e ọ huru na nwa-okoro ahu esoghi ayi bia, na ọ gānwu: ndi-orù-gi gēweda kwa isi-awọ orù-gi, bú nna-ayi, rue ala-mọ na nwuta. 32 N'ihi na orù-gi nọrọ nwa-okoro ahu mbe n'ebe nnam nọ, si, Ọ buru na emeghm ka ọ biakute gi, eme-hiewokwam megide nnam ubọchi ndum nile. 33 Ma ub͕u a, biko, ka orù-gi nọdu n'ọnọdu nwa-okoro a iburu onye-nwem orù; ma ka nwa-okoro a soro umu-nne-ya rigo. 34 N'ihi na m'gesi aṅa rigokuru nnam, ma nwa-okoro a esoghm rigo? ka m'we ghara ilekwasi ihe ọjọ ahu anya nke gāchọta nnam.

Jenesis 45

1 Ma Josef apughi ijisi onwe-ya ike n'iru ndi nile guzoworo onwe-ha n'akuku ya; o we kpọ òkù, si, Me ka madu ọ bula si n'ebe m'nọ pua. Ọ dighi kwa onye ọ bula guzoro n'ebe ọ nọ, mb͕e Josef mere ka umu-nne-ya mara ya. 2 Ọ we welie olu-ya n'ikwa-ákwá: ndi Ijipt we nu, ulo Fero nukwara. 3 Josef we si umu-nne-ya, Mu onwem bu Josef; nnam, ọ nọ ndu ub͕u a? Ma umu-nne-ya apughi iza ya; n'ihi na ha mara jijiji n'iru ya. 4 Josef we si umu-nne-ya, Biko, biakutenum nso. Ha we bia nso. Ọ si, Mu onwem bu Josef nwa-nne-unu, onye unu rere je n'Ijipt. 5 Ma ub͕u a ya ewutala unu, ya abu-kwa-la ihe iwe iwe di ọku n'anya-unu, na unu rerem bia n'ebe a: n'ihi na ọ bu idebe ndu ka Chineke zìrim ga n'iru unu. 6 N'ihi na arọ abua ndia ka oké unwu a di n'etiti ala: arọ ise fọdu-kwa-ra nke ilu-ọlu-ubi na owuwe-ihe-ubi nāgaghi-adi. 7 Chineke we zìem ga n'iru unu idoro unu n'uwa ndi fọduru, na idebere unu ndu ka unu buru oké ndi b͕apuru ab͕apu. 8 Ub͕a a kwa, Ọ bughi unu onwe-unu ziterem n'ebe a, kama Chineke: O we mem ka m'ghọrọ Fero nna, na onye-nwe ulo-ya nile, na onye nāchi ala Ijipt nile. 9 Menu ngwa, rigokuru nnam, si ya, Otú a ka nwa-gi Josef siri, Chineke, emewom ka m'ghọ onye-nwe Ijipt nile: ridakutem, atula ujọ: 10 i gēbi n'ala Goshen, nọkwam nso, gi onwe-gi, na umu-gi, na umu umu-gi, na ìgwè ewu na aturu-gi, na ìgwè ehi-gi, na ndi nile i nwere: 11 m'gāzù kwa gi n'ebe ahu; n'ihi na arọ ise nke oké unwu fọduru; ka ewe ghara inapu gi ihe nile, gi onwe-gi, na ulo-gi, na ndi nile i nwere. 12 Ma, le, anya-unu na anya nwa-nnem, bú Benjamin, nāhu na ọ bu ọnum nāgwa unu okwu. 13 Unu gēgosi kwa nnam nsọpurum nile n'Ijipt, na ihe nile nke unu huworo; unu gēme kwa ngwa me ka nnam ridata n'ebe a. 14 Ọ we dakwasi Benjamin, bú nwa-nne-ya, n'olu, kwa ákwá; Benjamin kwa-kwa-ra ákwá n'olu-ya. 15 Ọ we sutu umu-nne-ya nile ọnu, kwakwasi ha ákwá: emesia umu-nne-ya kpayere ya uka. 16 Ewe nu ùdé-ya n'ulo Fero, si, Umu-nne Josef abiawo: ọ di nma n'anya Fero, na n'anya ndi-orù-ya. 17 Fero we si Josef, Si umu-nne-gi, Menu nka; bonu anumanu-unu ibu, la, ba n'ala Kenean; 18 chiri-kwa-nu nna-unu na ulo-unu, biakutem: ka m'nye kwa unu ezi ihe nke ala Ijipt, unu gēri kwa urù ala nka. 19 Ma gi onwe-gi ka enyeworo iwu, menu nka; sinu n'ala Ijipt chiri ub͕ọ-ala n'ihi umu-ntakiri-unu, na n'ihi nwunye nile unu, kuru-kwa-nu nna-unu, bia. 20 Anya-unu adi-kwa-la n'ihe-unu; n'ihi na ezi ihe nke ala Ijipt nile, ọ bu unu nwe ya. 21 Umu Israel we me otú a: Josef we nye ha ub͕ọ-ala n'okwu-ọnu Fero, o nye kwa ha ihe ha gēri n'uzọ. 22 Ha nile n'otù ka o nyere uwe-nb͕okwasi nb͕anwe; ma o nyere Benjamin ọgu nkpuru-ego ọla-ọcha iri na ọgu ise na uwe-nb͕okwasi nb͕anwe ise. 23 O ziga-kwa-ra nna-ya otú a; inyinya-ibu iri nēbu ufọdu n'ezi ihe nke Ijipt, na nne-inyinya-ibu iri nēbu ọka na achicha na nri nna-ya gēri n'uzọ. 24 Ọ we zilaga umu-nne-ya, ha la: ọ si ha, Unu esela okwu n'uzọ. 25 Ha si n'Ijipt rigo, ba n'ala Kenean, biakute Jekob nna-ha. 26 Ha gosi ya, si, Josef nọ ndu ub͕u a, ha gosi kwa ya na ọ bu ya nāchi ala Ijipt nile. Obi-ya we b͕afue, n'ihi na ọ kweghi ha. 27 Ha we gwa ya okwu Josef nile nke ọ gwara ha: mb͕e ọ huru ub͕ọ-ala nile nke Josef ziri ibute ya, mọ nke Jekob, bú nna-ha, we di ndu: 28 Israel we si, O zuwo; Josef, bú nwam, nọ ndu ub͕u a: ka m'je, hu ya anya tutu mu anwua.

Jenesis 46

1 Israel we bulie ije, ya na ndi nile o nwere, ọ biarue Bia-sheba, chuara Chineke nke nna-ya Aisak aja. 2 Chineke we gwa Israel okwu n'ọhù nke abali, si, Jekob, Jekob. Ọ si Lekwam. 3 Ọ si, Mu onwem bu Chineke, bú Chineke nke nna-gi: atula egwu irida n'Ijipt; n'ihi na mba uku ka M'gēme gi ka i ghọ n'ebe ahu. 4 Mu onwem gēso gi rida n'Ijipt; ọ bu kwa Mu onwem gēme ka i rigota kwa n'ezie: Josef gātukwasi kwa aka-ya n'anya-gi abua. 5 Jekob we si na Bia-sheba bilie: umu Israel we buru Jekob, bú nna-ha, na umu-ntakiri-ha, na nwunye nile ha, n'ub͕ọ-ala nke Fero zitereri ibu ya. 6 Ha chiri anu-ulo-ha, na àkù-ha, bú nke ha kpatarari n'ala Kenean, bata n'Ijipt, bú Jekob na nkpuru-ya nile tiyere onwe-ya: 7 ya na umu-ya ndikom, na umu-ndikom nke umu-ya ndikom, umu-ya ndinyom, na umu-ndinyom nke umu-ya ndikom, ọ bu nkpuru-ya nile ka o mere ka ha so ya bata n'Ijipt. 8 Ma ndia bu aha umu Israel, ndi batara n'Ijipt, Jekob na umu-ya ndikom: ọkpara Jekob, bú Reuben. 9 Umu-ndikom Reuben; Hanok, na Palu, na Hezron, na Kami. 10 Umu-ndikom Simeon; Jemuel, na Jamin, na Ohad, na Jakin, na Zoba, na Shaul, bú nwa nke nwayi Kenean ahu. 11 Umu-ndikom Livai; Giashon, na Kohat, na Merari. 12 Umu-ndikom Juda; Ia, na Onan, na Shila, na Perez, na Zera: ma Ia na Onan nwuru n'ala Kenean. Umu-ndikom Perez bu kwa Hezron, na Hamul. 13 Umu-ndikom Isaka; Tola, na Puva, na Job, na Shimron. 14 Umu-ndikom Zebulun: Sered, na Ilon, na Jahleel. 15 Ndia bu umu-ndikom Lia, nke ọ muru nye Jekob nime Padan-eram, ha na Daina, bú nwa-ya nwayi nkpuru-obi nile nke umu-ya ndikom na umu-ya ndinyom bu orú na iri na atọ 16 Umu-ndikom Gad; Zifyon, na Hagi, na Shuni, na Ezbon, na Iri, na Arodi, na Areli. 17 Umu-ndikom Asha; Imna, na Ishva, na Ishvi, na Beria, na Sera, bú nwa-nne-ha nwayi: umu-ndikom Beria kwa; Heba na Malkiel. 18 Ndia bu umu-ndikom Zilpa, onye Leban nyere Lia nwa-ya nwayi, ọ we muara Jekob ndia, bú nkpurui-obi iri na isi. 19 Umu-ndikom Rechel, bú nwunye Jekob; Josef na Benjamin. 20 Ewe muara Josef n'ala Ijipt Manase na Efraim, ndi Asenat, bú nwa-nwayi Poti-fera onye-nchu-àjà nke On, muru nye ya. 21 Umu-ndikom Benjamin; Bela na Beka, na Ashbil, na Gira, na Neaman, na Ihi, na Rosh, na Mupim, na Hupim, na Ad. 22 Ndia bu umu-ndikom Rechel, ndi amuru nye Jekob: nkpuru-obi nile di iri na anọ. 23 Umu-ndikom Dan; Hushim. 24 Umu-ndikom Naftali; Jahzeel, na Guni, na Jiza, na Shilem. 25 Ndia bu umu-ndikom Bilha, onye Leban nyere Rechel nwa-ya nwayi, ọ we muara Jekob ndia: nkpuru-obi nile di asa. 26 Nkpuru-obi nile Jekob nwere ndi batara n'Ijipt, ndi siri n'úkwù-ya puta, nāgughi nwunye nile nke umu Jekob, nkpuru-obi nile di ọgu atọ na isi; 27 umu-ndikom Josef, ndi amuru nye ya n'Ijipt, di kwa nkpuru-obi abua; nkpuru-obi nile nke ulo Jekob, ndi nābata n'Ijipt, di ọgu atọ na iri. 28 Ma ọ bu Juda ka o zigara n'iru ya jekuru Josef, igosi ya uzọ n'iru ya rue Goshen; ha we bata n'ala Goshen 29 Josef we dozie ub͕o-ala-ya, rigorue Goshen izute Israel, bú nna-ya; ọ me ka ọ hu ya anya, ọ we dakwasi ya n'olu, kwa ákwá n'olu-ya mb͕e di anya. 30 Israel we si Josef, Ka m'nwua ub͕u a, mb͕e m'husiri iru-gi, na i nọ ndu rue ub͕u a. 31 Josef we si umu-nne-ya, si kwa ulo nna-ya, M'gārigo, gosi Fero, si ya, Umu-nnem na ulo nnam, ndi nọ n'ala Kenean, abiakutewom; 32 ma ndikom ahu bu ndi-ọzùzù ìgwè ewu na aturu, n'ihi na ndi ọlu-ha bu iche anu-ulo ka ha bu-woro; ọ bu kwa ìgwè ewu na aturu-ha na ìgwè ehi-ha, na ihe nile ha nwere, ka ha chitaworo. 33 Ma o gēru, mb͕e Fero gākpọ unu, si kwa, Gini bu ọlu unu nālu? 34 na unu gāsi, Ndi ọlu-ayi bu iche anu-ulo ka ndi orù-gi buworo site na mb͕e ayi di na nwata we rue ub͕u a, ma ayi onwe-ayi, ma nna-ayi-hà: ka unu we biri n'ala Goshen; n'ihi na onye ọ bula nāzù ìgwè ewu na aturu bu ihe-árú n'anya ndi Ijipt.

Jenesis 47

1 Josef we ba, gosi Fero, si, Nnam na umu-nnem, na ìgwè ewu na aturu-ha, na ìgwè ehi-ha, na ihe nile ha nwere, esiwo n'ala Kenean bia; ma, le, ha nọ n'ala Goshen. 2 O we si n'etiti umu-nne-ya nile chiri ndikom ise, guzo ha n'iru Fero. 3 Fero we si umu-nne-ya, Gini bu ọlu unu nālu? Ha si Fero, Ndi-ọzùzù ìgwè ewu na aturu ka ndi-orù-gi bu, ma ayi onwe-ayi, ma nna-ayi-hà. 4 Ha we si Fero, Inọ dika ọbìa n'ala nka ka ayi biaworo; n'ihi na ọ dighi ihe eji azù ìgwè ewu na aturu ahu nke ndi-orù-gi nwere; n'ihi na oké unwu a di arọ́ n'ala Kenean: ub͕u a kwa, biko, ka ndi-orù-gi biri n'ala Goshen. 5 Fero we gwa Josef okwu, si, Nna-gi na umu-nne-gi abiakutewo gi: 6 ala Ijipt, n'iru gi ka ọ di; me ka nna-gi na umu-nne-gi biri n'ebe kachasi nma nke ala nka; ha gēbiri n'ala Goshen: ọ buru kwa na i mara, si, na ndi-dìnkpà dí n'etiti ha, i gēdo kwa ha ndi-isi anu-ulo m'nwere. 7 Josef we me ka Jekob nna-ya bata, o guzo ya n'iru Fero: Jekob we gọzie Fero. 8 Fero we si Jekob, Ùbọchi arọ ndu-gi di ole? 9 Jekob we si Fero, Ubọchi arọ nke ọnọdu-ọbìam nile di ọgu arọ isi na iri: ha di ole-na-ole, jọ kwa njọ, bú ubọchi arọ ndum, ha erughi kwa ubọchi arọ ndu nke nnam-hà n'ubọchi ọnọdu-ọbia-ha. 10 Jekob we gọzie Fero, si n'iru Fero pua. 11 Josef we me ka nna-ya na umu-nne-ya biri n'ala, ọ nye kwa ha ihe-onwunwe n'ala Ijipt, n'ebe kachasi nma nke ala ahu, n'ala Rameses, dika Fero nyere iwu. 12 Josef were nri zùa nna-ya, na umunne ya, na ulo nile nke nna-ya, dika ọnu-ọgugu nke umu-ntakiri si di. 13 Nri adighi n'ala ahu nile; n'ihi na oké unwu ahu di arọ́ nke-uku, ala Ijipt na ala Kenean we nāda mbà n'ihi oké unwu ahu. 14 Josef we chikọta ego nile anāchọta n'ala Ijipt, na n'ala Kenean, n'ọnọdu ọka ndi ahu nāzu: Josef we chita ego ahu n'ulo Fero. 15 Ego we gwu-chapu n'ala Ijipt, na n'ala Kenean, ndi Ijipt nile we biakute Josef, si, Nye ayi nri, n'ihi gini ka ayi nānwu n'iru gi? n'ihi na ego agwuwo. 16 Josef we si, Nyenu anu-ulo-unu; ka m'nye kwa unu nri n'ọnọdu anu-ulo-unu, ma ọ buru na ego agwu. 17 Ha we chiri anu-ulo-ha biakute Josef: Josef we nye ha nri n'ọnọdu inyinya-ha, na n'ọnọdu anu-ulo-ha, bú ìgwè ewu na aturu, na n'ọnọdu anu-ulo-ha, bú ìgwè ehi, na n'ọnọdu inyinya-ibu-ha, we were nri nāzù ha n'arọ ahu n'ọnọdu anu-ulo-ha nile. 18 Arọ ahu we gwu, ha we bia-kute ya n'arọ nke-abua, si ya, Ayi agaghi-ezonari onye-nwem, na ọ buru na ego agwusia, ọ buru kwa na onye-nwem nwere anu-ulo, bú anumanu-ayi, ọ dighi ihe fọduru n'iru onye-nwem, ma-ọbughi aru-ayi na ala-ayi: 19 n'ìhi gini ka ayi nānwu n'anya-gi, ma ayi, ma ala-ayi? zuru ayi na ala-ayi n'ọnọdu nri, ayi onwe-ayi na ala-ayi gāghọ-kwa-ra Fero ndi-orù: gi nye kwa ayi nkpuru-ọghigha, ka ayi we di ndu, ghara inwu anwu, ka ala we ghara kwa itọb͕ọrọ n'efù. 20 Josef we zutara Fero ala Ijipt nile; n'ihi na ndi Ijipt rere ọhia-ha, onye ọ bula ọ re nke ya, n'ihi na oké unwu ahu siri ike n'aru ha: ala ahu we ghọ ihe Fero nwere. 21 Ma ndi ahu, ọ mere ka ha gabiga ba n'obodo nile site n'otu nsọtu ókè-ala Ijipt rue nsọtu-ya ọzọ. 22 Nání ala ndi-nchu-àjà ka ọ nāzu-tagh: n'ihi na ndi-nchu-àjà nwere òkè nri sitere n'ebe Fero nọ, ha ri-kwa-ra òkè-nri-ha nke Fero nyere ha; n'ihi nka ha ereghi ala-ha. 23 Josef we si ndi ahu, Le, azutawom unu na ala-unu nye Fero ta: le, unu gēnwe nkpuru-ọghigha, unu gāgha kwa nkpuru n'ala. 24 O gēru kwa, n'ọmume-ya, na unu gēnye Fero ọtù uzọ n'uzọ ise, uzọ anọ aburu kwa ihe unu nwere, ibu nkpuru-ọghigha nke ubi, na ibu ihe-oriri-unu, na iburu ndi nọ n'ulo-unu ihe-oriri, na iburu umu ntakiri-unu ihe-oriri. 25 Ha si, I debewo ayi ndu: ka ayi huta amara n'iru onye-nwem, ayi gāghọrọ Fero ndi-orù. 26 Josef we me ya ka ọ buru ukpuru bayere ala nke Ijipt rue ta, na Fero gēnwe otù uzọ n'uzọ ise; nání ala ndi-nchu-àjà nwere iche nāghọghi ihe Fero nwere. 27 Israel we biri n'ala Ijipt, n'ala Goshen; ha we nwe ihe-onwunwe nime ya, mu kwa ọmùmù, ba uba nke-uku. 28 Jekob we di ndu n'ala Ijipt arọ iri na asa: ubọchi Jekob, bú arọ ndu-ya, we di ọgu arọ asa na asa. 29 Ubọchi Israel gānwu we rue nso: ọ kpọ nwa-ya Josef, si ya, Biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru gi, biko, tiye aka-gi n'okpuru apata-ukwum, me-kwa-ram ebere na ezi-okwu; biko, elìlam n'Ijipt: 30 kama mu na nnam-hà gēdina, i gēsi kwa n'Ijipt bupum, lìkwam n'ílì-ha. Ọ si, Mu onwem gēme dika okwu-gi si di. 31 Ọ si, Ṅuaram iyi: o we ṅuara ya iyi. Israel we kpọ isi ala n'elu ihe-ndina-ya.

Jenesis 48

1 O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na otù onye siri Josef, Le, nna-gi nāria ọria: o we chiri umu-ya ndikom abua ka ha so ya je, bú Manase na Efraim. 2 Otù onye we gosi Jekob, si, Le, nwa-gi Josef nābiakute gi: Israel we jisie ike, nọdu n'elu ihe-ndina-ya. 3 Jekob we si Josef, Chineke Nke puru ime ihe nile mere ka m'hu Ya anya na Luz n'ala Kenean, Ọ gọziem, 4 sim, Le, M'nēme gi ka i mua ọmùmù, M'gēme kwa gi ka i ba uba, M'gēme kwa gi ka i ghọ nkpọkọta ndi di iche iche; M'gēnye kwa nkpuru-gi gānọchi gi ala nka, ka ọ buru ihe-onwunwe ebighi-ebi. 5 Ma ub͕u a umu-gi ndikom abua, ndi amuru nye gi n'ala Ijipt tutu mu abiakute gi n'Ijipt, nkem ka ha bu; Efraim na Manase, dika Reuben na Simeon, gābu ndi m'nwere. 6 Ma umu-gi, ndi i musoworo ha, ọ bu gi nwe ha; n'aha umu-nne-ha ka agākpọ ha n'ihe-nketa-ha. 7 Ma mu onwem, mb͕e m'siri na Padan bia, Rechel nwuru n'akukum n'ala Kenean n'uzọ, mb͕e uzọ foduru ibiaru Efrat: m'we lìe ya n'ebe ahu n'uzọ Efrat (nke ahu bu Bet-lehem). 8 Israel we hu umu-ndikom Josef, ọ si Òle ndi bu ndia? 9 Josef we si nna-ya, Umum ka ha bu, ndi Chineke nyeworom n'ebe a. Ọ si, Biko, chitaram ha, m'gāgọzi ha. 10 Ma anya Israel di arọ́ site n'agadi ọ bu, ọ pughi ihu uzọ. O me ka ha biakute ya nso; o we sutu ha ọnu, b͕akua ha. 11 Israel we si Josef, Echeghm ihu iru-gi: ma, le, Chineke emewo ka m'hu kwa nkpuru-gi. 12 Josef we me ka ha puta n'etiti ikperè-ya abua: ọ kpọ isi ala, kpuchie iru-ya n'ala. 13 Josef we chiri ha abua, Efraim n'aka-nri-ya n'ebe aka-ekpe Israel di, na Manase n'aka-ekpe-ya n'ebe aka-nri Israel di, ọ we me ka ha biakute ya nso. 14 Israel we setia aka-nri-ya tukwasi ya n'isi Efraim, onye bu nke-ntà, na aka-ekpe-ya n'isi Manase, nātub͕a aka-ya abua; n'ihi na Manase bu ọkpara. 15 Ọ we gọzie Josef, si, Chineke ahu, Nke nnam-hà, bú Abraham na Aisak, nējeghari n'iru Ya, Chineke ahu Nke nāzùm ogologo ogem rue taa, 16 Mọ-ozi ahu Nke nāb͕aputam n'aka ihe ọjọ nile, Ya gọzie umu-okoro ndia; ka akpọ kwa n'isi ha aha nkem, na aha nnam-hà, bú Abraham na Aisak; ka ha ba kwa uba rue ọtutu madu n'etiti uwa. 17 Josef we hu na nna-ya nātukwasi aka-nri-ya n'isi Efraim, ọ we jọ njọ n'anya-ya: ọ we welie aka nna-ya, iwepu ya n'isi Efraim tiye n'isi Manase. 18 Josef we si nna-ya, Ọ bughi otú a, nnam: n'ihi na nka bu ọkpara; tukwasi aka-nri-gi n'isi-ya. 19 Nna-ya we ju, si, Amawom, nwam, amawom: ya onwe-ya gāghọ kwa otù ndi, ya onwe-ya gādi kwa uku: ma otú ọ di, nwa-nne-ya nke-ntà gādi uku kari ya, nkpuru-ya gāghọ kwa ùjú nke mba nile. 20 Ọ we gọzie ha n'ubọchi ahu, si, Nime gi ka Israel gāgọzi, si, Chineke me gi ka i di ka Efraim, ka i di kwa ka Manase: ọ we do Efraim n'iru Manase. 21 Israel we si Josef, Le, mu onwem gaje inwu: ma Chineke gānọyere unu, me kwa ka unu lata n'ala nna-unu-hà. 22 Mu onwem enyewo kwa gi otù akuku ugwu kari umu-nne-gi, nke m'ji mma-agham, ji kwa utam, nara n'aka ndi-Amorait.

Jenesis 49

1 Jekob we kpọ umu-ya ndikom òkù, si: Chikọtanu onwe-unu, ka m'we gosi unu ihe gādakwasi unu na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia. 2 Zukọnu, nukwanu, umu-ndikom Jekob; Genu nti n'olu Israel, bú nna-unu. 3 Reuben, ọkparam ka i bu, ikem, na nkpuru mbu nke umem; Ọkaka nke nbuli-elu, na ọkaka nke ike. 4 I nāb͕oghari dika miri, akarila akari; N'ihi na i rigoro n'ihe-ndina nna-gi: Mb͕e ahu i mere ya ka ọ ghara idi nsọ: ọ rigoro n'utem. 5 Simeon na Livai bu nwa-nne; Ihe nke ihe-ike bu mma-agha-ha. 6 Abala n'ìzù-ha, nkpuru-obim; Gi na nkpọkọta-ha abula otù, nsọpurum; N'ihi na n'iwe-ha ka ha b͕uru nwoke, Ọ bu kwa n'ime ihe nātọ ha ka ha bipuru nkwonkwo-ukwu ehi. 7 Ihe anābu ọnu ka iwe-ha bu, n'ihi na ọ di ike; Ọnuma-ha bu kwa ihe anābu ọnu, n'ihi na o sika ike: M'gēkesa ha nime Jekob, B͕asa kwa ha n'Israel. 8 Juda, gi onwe-gi, umu-nne-gi gēkele gi: Aka-gi di n'olu ndi-iro-gi; Umu-ndikom nna-gi gākpọ isi ala nye gi. 9 Nwa-ọdum ka Juda bu; N'anu adọb͕uru, nwam, ka i siworo rigo; O ruru ala, ọ makpuru dika ọdum, Na dika nne-ọdum; ònye gēme ka o bilie? 10 Nkpa-n'aka eze agaghi-esi n'ebe Juda nọ wezuga onwe-ya, Nkpa-n'aka onye nēnye ukpuru agaghi-esi kwa n'etiti ukwu-ya abua wezuga onwe-ya, Rue mb͕e Shailo gābia; Ọ bu kwa ya gēnwe iṅa-nti ndi di iche iche. 11 O nēlibe nwa-inyinya-ibu-ya n'osisi vine, O nēlibe kwa nwa nke nne-inyinya-ibu-ya n'osisi vine kachasi nma; Ọ suworo uwe-ya nime manya-vine, Su kwa ákwà-nb͕okwasi-ya n'ọbara nkpuru-vine: 12 Anya-ya abua nācha ọbara-ọbara site na manya-vine, Ezé-ya nēnwu kwa ọcha site na miri-ara-ehi. 13 Zebulun, n'ọnu-miri nke oké osimiri ka o gēbi: Ya onwe-ya gānọ kwa n'ọnu-miri nke ub͕o. Akuku-ya gādi kwa n'akuku Zaidon. 14 Isaka bu inyinya-ibu di ike, Nāmakpuru n'etiti ogige-aturu abua: 15 Ọ we hu izu-ike, na ọ di nma, Hu kwa ala ahu, na ọ di uto; Ọ we chebe ubu-ya ibu ibu, We ghọ onye nēfè òfùfè orù. 16 Dan gēkpeputa ndi-ya, Dika otù nime ebo nile nke Israel. 17 Ka Dan buru agwọ n'uzọ, Aju-ala n'okporo-uzọ, Nke nāta ikiri-ukwu inyinya aru, Onye o nēbu we daghachi azu. 18 Nzọputa-Gi ka m'cheworo, Jehova 19 Gad, usu ndi nāpunara madu ihe gākpagide ya: Ma ya onwe-ya onwe-ya gākpagide ha n'ikiri-ukwu. 20 Asha ka abuba si aputa, bú nrí-ya, Ya onwe-ya gēnye kwa ihe-utọ di iche iche nke eze. 21 Naftali bu nne-ele arapuworo arapu: Bú onye ahu nke nēnye okwu-ọnu nile di utọ. 22 Nwa osisi nke nāmi nkpuru ka Josef bu, Nwa osisi nke nāmi nkpuru nke di n'akuku isi-iyi; Umu-ya ndinyom nāribiga mb͕idi. 23 Ndi-ọ̀kà-uta mere ya ihe-ilú, B͕a kwa ya àkú, kpọ kwa ya asì: 24 Ma uta-ya nānọgide n'idi-ike, Ab͕a-kwa-ra ogwe-aka-ya abua ume, Site n'aka Dike nke Jekob, (N'ebe ahu ka onye-ọzùzù-aturu si bia, bú nkume Israel, ) 25 Site na Chineke nke nna-gi; Ya yere gi aka! Na Onye Nke puru ime ihe nile; Ya gọzie gi! Ngọzi nile nke elu-igwe site n'elu, Ngọzi nile nke ob͕u-miri nke nāma-kpu n'okpuru, Ngọzi nile nke ara na nke àkpà-nwa. 26 Ngọzi nile nke nna-giAdiwo ike kari ngọzi nile nke ndi murumRue ókè nke ugwu ebighi-ebi: Ha gādi n'isi Josef, Na n'opù-n'isi nke onye ekewapuru n'etiti umu-nne-ya. 27 Benjamin bu wolf nke nādọb͕u anu: N'ututu o nēri anu ọ dọb͕uru, N'anyasi o nēkesa kwa ihe ọ kwatara. 28 Ndia nile bu ebo Israel iri na abua: nka bu kwa ihe nna-ha gwara ha, ọ we gọzie ha; onye ọ bula n'ihe nke di ka ngọzi-ya si di, otú a ka ọ gọziri ha. 29 Ọ we nye ha iwu, si ha, Anāchikọta mu onwem na ndi nkem n'ala-mọ: lìenum n'ebe nnam-hà di n'ọb͕à nke di n'ọhia nke Efron, bú onye Het, 30 n'ọb͕à nke di n'ọhia Makpila, nke di n'iru Mamre, n'ala Kenean, nke Abraham zutara, ya na ọhia ahu, n'aka Efron onye Het, ka ọ buru ihe-onwunwe nke gābu ala-ílì: 31 n'ebe ahu ka ha lìri Abraham na Sera nwunye-ya; n'ebe ahu ka ha lìri Aisak na Rebeka nwunye-ya; ọ bu kwa n'ebe ahu ka m'liri Lia: 32 azutara ọhia ahu na ọb͕à ahu nke di nime ya n'aka umu Het. 33 Jekob we nyebie umu-ya ndikom iwu, chikọta ukwu-ya n'ihe-ndina-ya, kubie ume, ewe chikọta ya na umu-nna-ya n'ala-mọ.

Jenesis 50

1 Josef we dakwasi n'iru nna-ya, kwakwasi ya ákwá, sutu kwa ya ọnu. 2 Josef we nye ndi-orù-ya, bú ndi-dibia, iwu ib͕asì ozu nna-ya; ndi-dibia ahu we b͕asì ozu Israel. 3 Ewe debezuere ya ọgu ubọchi abua: n'ihi na otú a ka anēdebezu ubọchi ndi anāb͕asì ozu-ha: ndi Ijipt we kwara ya ákwá ọgu ubọchi atọ na iri. 4 Ubọchi ikwara ya ákwá we gabiga, Josef we gwa ulo Fero okwu, si, Biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru unu, biko, kwuenu na nti Fero, si. 5 Nnam merem ka m'ṅua iyi, si, Le, mu onwem gaje inwu: n'ílìm nke m'doziworo onwem n'ala Kenean, n'ebe ahu ka i gēlìm. Ma ugbua, biko, ka m'rigo, lìe nnam, lata. 6 Fero we si, Rigo, lìe nna-gi, otú o mere gi ka i ṅua iyi. 7 Josef we rigo ilì nna-ya: ndi-orù Fero nile, na ndi-okenye ulo-ya, na ndi-okenye nile nke ala Ijipt, 8 na ulo Josef nile, na umu-nne-ya, na ulo nna-ya, we so ya rigo: nání umu-ntakiri-ha, na ìgwè ewu na aturu-ha, na ìgwè ehi-ha, ka ha rapuru n'ala Goshen. 9 Ma ub͕o-ala ma ndi inyinya nēbu we so ya rigo: ọmuma-ulo-ikwū ahu we di oké uku. 10 Ha biarue ebe-nzọcha-ọka nke Atad, nke di n'ofè Jọdan, ha we were iti-aka-n'obi di uku di kwa ike nke-uku ti aka n'obi n'ebe ahu: ọ we mere nna-ya oruru-újú ubọchi asa. 11 Ndi bi n'ala ahu, bú ndi Kenean, we hu oruru-újú ahu n'ebe-nzọcha-ọka nke Atad, ha si, Nka buru ndi Ijipt oruru-újú di arọ́: n'ihi nka akpọrọ aha-ya Ebel-Mizraim, nke di n'ofè Jọdan. 12 Umu-ya ndikom we mere ya otú a dika ọ nyere ha iwu: 13 umu-ya ndikom we bubata ya n'ala Kenean, lìe ya n'ọb͕a nke ọhia Makpila, nke Abraham zutara, ya na ọhia, ka ọ buru ihe-onwunwe nke gābu ala-ílì, n'aka Efron onye-Het, n'iru Mamre. 14 Josef we laghachi n'Ijipt, ya onwe-ya, na umu-nne-ya, na ndi nile soro ya rigo ilì nna-ya, mb͕e o lìsiri nna-ya. 15 Ma mb͕e umu-nne Josef huru na nna-ha anwuruwo, ha si, Eleghi anya Josef gākpọ ayi asì, ọ gēnyeghachi kwa ayi n'ùjú ihe ọjọ nile ayi mere ya. 16 Ha we nye otù onye iwu n'ebe Josef nọ, si, Nna-gi nyere iwu tutu ọnwu-ya, si, 17 Otú a ka unu gāsi Josef, Ariọm i, biko, b͕aghara njehie umu-nne-gi, na nmehie-ha, n'ihi na ọ bu ihe ọjọ ka ha meworo gi: ub͕u a kwa, biko, b͕aghara njehie ndi-orù Chineke nke nna-gi. Josef we kwa ákwá mb͕e ha gwara ya okwu. 18 Umu-nne-ya we je kwa, da n'ala n'iru ya, si, Le, ayi gāburu gi ndi-orù. 19 Josef we si ha, Unu atula egwu: n'ihi na ọ̀ bu n'ọnọdu Chineke ka m'nọ? 20 Unu onwe-unu kwa, unu chere ihe ọjọ megidem; Chineke chere ya ka ọ buru ezi ihe, ime dika ọ di ta, idebe ọtutu ndi ndu. 21 Ma ub͕u a unu atula egwu: mu onwem ganāzù unu na umu-ntakiri-unu. Ọ we kasie ha obi, gwa ha okwu nāba ha n'obi. 22 Josef we biri n'Ijipt, ya onwe-ya, na ulo nna-ya. Josef we di ndu ọgu arọ ise na iri. 23 Josef we hu umu Efraim nke umu-umu nke-atọ: amu-kwa-ra umu Makia nwa Manase n'ikperè abua nke Josef. 24 Josef we si umu-nne-ya, Mu onwem gaje inwu: ma Chineke gēleta unu n'ezie, me ka unu si n'ala nka rigorue ala ahu nke Ọ ṅuru Abraham na Aisak iyi bayere ya. 25 Josef we me ka umu Israel ṅua iyi, si, Chineke gēleta unu n'ezie, unu gēsi kwa n'ebe a bugo ọkpukpum. 26 Josef we nwua, ọ b͕ara ọgu arọ ise na iri: ha we b͕asì ozu-ya etiye ya n'ib͕e n'Ijipt.

Ọpupu 1

1 Ma ndia bu aha umu-ndikom Israel, ndi batara n'Ijipt; ha soro Jekob bata, nwoke ọ bula na ulo-ya. 2 Reuben, na Simeon, na Livai, na Juda; 3 Isaka, na Zebulun, na Benjamin; 4 Dan, na Naftali, na Gad, na Asha. 5 Madu nile ndi si n'úkwù Jekob puta di kwa ọgu madu atọ na iri: ma Josef, ọ nọri n'Ijipt. 6 Josef we nwua, ya na umu-nne-ya nile, na ọb͕ọ ahu nile. 7 Ma umu Israel muru ọmùmù, ri nne, ba uba, we nwe ume nke uku; ala ahu we juputa na ha. 8 Ma eze ọhuu biliri ichi Ijipt, onye nāmaghi Josef. 9 Ọ we si ndi-ya, Le, ndi umu Israel di ọtutu nwe kwa ume kari ayi: 10 ngwa, ka ayi gosi onwe-ayi na ndi mara ihe n'ebe ha nọ; ka ha we ghara iba uba, o we rue, mb͕e agha gāda n'ala-ayi, na ha gētiyekọta onwe-ha n'aru ndi nākpọ ayi asì, ha we buo agha megide ayi, si n'ala nka rigopua. 11 Ha we do ndi-isi nke ndi nēfè òfùfè n'isi ha iwere ibu-ha weda ha ala. Ha we wuere Fero obodo abua ichikobata ihe, bú Paitom na Raamses. 12 Ma dika ha nēweda ha ala, otú a ka ha nāba uba, otú a ka ha nāb͕asa kwa. Ike we gwusia ha n'ihi umu Israel. 13 Ndi Ijipt we were nkpab͕u me umu Israel ka ha fè òfùfè: 14 ha we were òfùfè siri ike me ka ndu-ha di ilu, n'urọ, na nime brick, na n'òfùfè nile ọ bula n'ọhia, òfùfè-ha nile nke ha mere ka ha fè nime ha di na nkpab͕u. 15 Eze Ijipt we si ndinyom Hibru ndi nēle ime, ndi aha otù onye nime ha bu Shifra, aha nke onye nke-abua bu kwa Pua: 16 ọ si, Mb͕e unu nēle ime ndinyom Hibru, we hu ha n'elu oche ọmumu-nwa; ọ buru na nwa-nwoke ka ọ bu, unu gēme kwa ka ọ nwua; ma ọ buru na nwa-nwayi ka ọ bu, ọ gādi kwa ndu. 17 Ma ndinyom nke nēle ime nātu egwu Chineke, ha emeghi kwa dika eze Ijipt gwara ha, ma ha debere umu-ndikom ndu. 18 Eze Ijipt we kpọ ndinyom ahu nēle ime, ọ si ha, Gini mere unu ji me ihe a, we debe umu-ndikom ndu? 19 Ndinyom nēle ime we si Fero, N'ihi na ndinyom Hibru adighi ka ndinyom Ijipt; n'ihi na ndi nwere ndu ka ha bu, ha nāmu kwa nwa tutu ndinyom nke nēle ime abiakute ha. 20 Chineke we me ndinyom nēle ime nma: ndi Israel we ba uba, nwe kwa ume nke-uku. 21 O rue, n'ihi na ndinyom nke nēle ime nātu egwu Chineke, na O mere èzí-na-ulo nye ha. 22 Fero we nye ndi-ya nile iwu, si, Nwa-nwoke ọ bula amuru, n'osimiri Nail ka unu gētufu ya, ma unu gēdebe nwa-nwayi ọ bula ndu.

Ọpupu 2

1 Otù nwoke nke sitere n'ulo Livai we je luru nwa-nwayi Livai na nwunye. 2 Nwayi ahu we turu ime, mua nwa-nwoke: mb͕e ọ huru ya na nwa mara nma ka ọ bu, o zobe ya ọnwa atọ. 3 Ọ pughi kwa izobe ya ọzọ, ọ we meere ya ub͕ọ papyrus, were kwa bitumen na pitch te ya; o we tiye nwa ahu nime ya, tiye ya n'etiti ami n'usọ osimiri Nail. 4 Nwa-nne-ya nwayi we guzo onwe-ya n'ebe di anya, imara ihe gēme ya. 5 Nwa-nwayi Fero we ridata isa aru n'osimiri Nail; umu-ab͕ọghọ-ya we nējeghari n'akuku osimiri Nail ahu; o we hu ub͕ọ ahu n'etiti ami, zìe orù-ya nwayi iweta ya. 6 O we meghe ya, hu nwa ahu, ma, le, ọ bu nwata-nwoke nākwa ákwá. O we nwe ọmiko n'aru ya, si, Otù nime umu ndi-Hibru ka nka bu. 7 Nwa-nne-ya nwayi we si nwa-nwayi Fero, #M'gēje kpọrọ gi nwayi nēnye nwa ara site na ndinyom Hibru, ka ọ we nyere gi nwa nka ara? 8 Nwa-nwayi Fero we si ya, Je. Nwa-ab͕ọghọ ahu we je kpọ nne nwa ahu. 9 Nwa-nwayi Fero we si ya, Kuru nwa nka la, nyerem ya ara, mu onwem gēnye kwa gi ugwọ-ọlu-gi. Nwayi ahu we kuru nwa ahu, nye ya ara. 10 Nwa ahu we tó etó, nne-ya we me ka ọ biakute nwa-nwayi Fero, ọ we ghọrọ ya nwa nke ya. Ọ kpọ aha-ya Moses, si, N'ihi na nime miri ka m'dọputara ya. 11 O rue na mb͕e ahu, mb͕e Moses toputaworo, na ọ pukuru umu-nne-ya, ihu ihe ngbu ha anya: o we hu nwoke Ijipt ka o nētib͕u nwoke Hibru, otù nime umu-nne-ya. 12 Ọ we lee anya n'otù akuku, lee kwa anya n'akuku ọzọ, ma mb͕e ọ huru na ọ dighi onye ọ bula, o tib͕ue onye Ijipt ahu, zobe ya n'ájá. 13 Ọ we pua n'ubọchi nke-abua, ma, le, ndikom Hibru abua nālu ọ̀gù: ọ we si onye ahu nke ikpe mara, N'ìhi gini ka i nētib͕u nwanne gi? 14 Ọ si, Ònye mere gi ka i buru onye-isi na onye-ikpe n'ebe ayi nọ. Ọ̀ bu ib͕um ka gi onwe-gi nēkwu okwu-ya, dika i b͕uru onye Ijipt? Moses we tua egwu, si, N'ezie amawo okwu a. 15 Fero we nu okwu a, ọ we chọ ib͕u Moses. Moses we b͕apu n'iru Fero, nọdu n'ala Midian: o we nọdu ala n'akuku olùlù-miri. 16 Ma onye-nchu-àjà Midian nwere umu-ndinyom asa: ha we bia, se miri, b͕aju ebe anētiye miri ime ka ìgwè ewu na aturu nke nna-ha ṅua. 17 Ndi-ọzùzù-aturu we bia, chupu ha: ma Moses biliri, zọputa ha, me ka ìgwè ewu na aturu-ha ṅua miri. 18 Ha we biakute Reuel, bú nna-ha, ọ si, Gini mere unu ji bia ngwa ngwa ta? 19 Ha si, Nwoke Ijipt o setara ayi miri nke-ọma, me ka ìgwè ewu na aturu-ayi ṅua. 20 Ọ si umu-ya ndinyom, Òle ebe ọ nọ kwa? n'ìhi gini bu nka na unu arapuwo nwoke ahu? kpọnu ya, ka o we rie nri. 21 Moses we kwere ibiri n'ulo nwoke ahu: o we nye Moses Zipora nwa-ya nwanyi na nwunye. 22 Nwanyi ahu we mua nwa-nwoke, Moses we kpọ aha-ya Giashom: n'ihi na ọ siri, Ọbìa ka m'bu-woro n'ala ọzọ. 23 O rue, n'ọtutu ubọchi ahu, na eze Ijipt nwuru: umu Israel we nēze ume n'ihi òfùfè-ha, ha we tie nkpu, ntiku ha tikuru Chineke we rigorue Chineke nti, n'ihi òfùfè ahu. 24 Chineke we nu isu-ude-ha, Chineke we cheta ọb͕ub͕a-ndu-Ya, nke Ya na Abraham na Aisak na Jekob b͕ara. 25 Chineke we hu umu Israel, Chineke we mara.

Ọpupu 3

1 Ma Moses nāzù ìgwè ewu na aturu nke Jetro, bú nna nwunye-ya, bú onye-nchu-àjà Midian: ọ we duru ìgwè ewu na aturu ahu ga n'azu ọzara, ọ we biarue ugwu nke Chineke, rue Horeb. 2 Mọ-ozi nke Jehova we me ka ọ hu ya anya n'ire ọku site n'etiti osisi ntà: o we hu, ma, le, osisi ntà ahu nēre ọku, ma erepiaghi osisi ntà ahu. 3 Moses we si, Ka m'wezuga onwem, hu oké ihe-ọhuhu nka; gini mere osisi ntà ahu nējighi rechapu? 4 Jehova we hu na o wezugara onwe-ya ihu, Chineke we si n'etiti osisi ntà ahu kpọ ya òkù, si, Moses, Moses. Ọ si, Lekwam. 5 Ọ si, Abiarula nso ebe a: yipu akpukpọ-ukwu-gi n'ukwu-gi abua, n'ihi na ebe nke gi onwe-gi nēguzo n'elu ya, ala nsọ ka ọ bu. 6 Ọ si kwa, Mu onwem bu Chineke nke nna-gi, Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob. Moses we zobe iru-ya; n'ihi na ọ nātu egwu ilegide Chineke anya. 7 Jehova we si, Ahuwom n'ezie nweda-n'ala nke ndim nke di n'Ijipt, anuwokwam iti-nkpu-ha n'ihi ndi nāchi ha n'ihe-ike; n'ihi na amawom ihe-nb͕u-ha nile; 8 M'we ridata inaputa ha n'aka ndi Ijipt, na ime ka ha si n'ala ahu rigorue ala di nma nke sa-kwa-ra mbara, rue ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù na ya; rue ebe nke ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus. 9 Ma ub͕u a, le, iti-nkpu umu Israel eruwom nti: ọzọ kwa, ahuwom nmeb͕u nke ndi Ijipt nēmeb͕u ha. 10 Ub͕u a kwa, bia, M'gēzì kwa gi jekuru Fero; gi me kwa ka ndim, bú umu Israel, si n'Ijipt puta. 11 Ma Moses siri Chineke, Ònye ka m'bu, na m'gējekuru Fero, na m'gēme kwa ka umu Israel si n'Ijipt puta? 12 Ọ si, N'ihi na Mu na gi gānọ; nka bu-kwa-ra gi ihe-iriba-ama na Mu onwem ezigawo gi: mb͕e i gēme-wori ka ndim si n'Ijipt puta, unu gēfè Chineke n'elu ugwu a. 13 Moses we si Chineke, Le, mb͕e mu onwem nābiakute umu Israel, si ha, Chineke nke nna-unu-hà ezitewom n'ebe unu nọ; mb͕e ha gāsikwam, Gini bu aha-Ya? ọ̀ bu gini ka m'gāsi ha? 14 Chineke we si Moses, ABUM IHE M'BU: Ọ si kwa, Otú a ka i gāsi umu Israel, ABUM ezitewom n'ebe unu nọ. 15 Chineke si-kwa-ra Moses ọzọ, Otú a ka i gāsi umu Israel, Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob, O zitewom n'ebe unu nọ: nka bu aham rue mb͕e ebighi-ebi, nka bu kwa ihe-nchetam rue ọb͕ọ nile. 16 Je, chikọta ndi-okenye Israel, si ha, Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, Chineke nke Abraham na Aisak na Jekob, Ọ mewom ka m'hu Ya anya, Ọ si, Eletawom unu n'ezie, hu kwa ihe anēme unu n'Ijipt: 17 M'we si, M'gēme ka unu si na nweda-n'ala nke Ijipt rigorue ala nke ndi Kenean na ndi Het na ndi-Amorait na ndi-Perizait na ndi-Haivait na ndi Jebus, rue ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù na ya. 18 Ha gēge kwa nti n'olu-gi: i gābiakute kwa eze Ijipt, gi onwe-gi na ndi-okenye Israel, unu gāsi kwa ya, Jehova, bú Chineke nke ndi-Hibru, ezutewo ayi: ub͕u a kwa, biko, ka ayi je ije nke ubọchi atọ n'ọzara, ka ayi we chuara Jehova, bú Chineke-ayi, àjà. 19 Ma Mu onwem mara na eze Ijipt agaghi-ekwe unu je, é-è, ọ bughi n'aka di ike. 20 M'gēsetipu kwa akam, tib͕u Ijipt n'oké ọlum nile nke M'gālu n'etiti ya: emesi kwa o gēzilaga unu. 21 M'gēnye kwa ndi nka amara n'iru ndi Ijipt: o gēru kwa, mb͕e unu nāla, na unu agaghi-ab͕a aka la; 22 ma nwayi ọ bula gāriọta n'aka nwayi-ab͕ata-obi-ya, na n'aka nwayi nọ n'ulo-ya dika ọbìa, ihe ọla-ọcha, na ihe ọla-edo, na uwe-nb͕okwasi: unu gētiye kwa ha n'aru umu-unu ndikom na n'aru umu-unu ndinyom; unu gānapu kwa ndi Ijipt ihe-ha n'aka.

Ọpupu 4

1 Moses we za, si, Ma, le, ha agaghi-ekwem, ha agaghi-ege kwa nti n'olum: n'ihi na ha gāsi, Jehova emeghi ka i hu Ya anya. 2 Jehova we si ya, Gini bu ihe ahu di n'aka-gi? Ọ si, Nkpa-n'aka. 3 Ọ si, Tuda ya n'ala. Ọ we tuda ya n'ala, o we ghọ agwọ; Moses we b͕apu n'iru ya. 4 Jehova we si Moses, Setipu aka-gi, jide ya n'ọdùdù: (ọ we setipu aka-ya, jide ya, ọ we ghọ nkpa-n'aka-ya: ) 5 ka ha we kwe na Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob, emewo gi ka i hu Ya. 6 Jehova si-kwa-ra ya ọzọ, Biko, tiye aka-gi n'obi-gi. Ọ we tiye aka-ya n'obi-ya: ọ we weputa ya, ma, le, aka-ya bu ekpenta, dika aku mmiri igwe. 7 Ọ we si, Tiyeghachi aka-gi n'obi-gi. (Ọ we tiyeghachi aka-ya n'obi-ya; ọ we weputa ya n'obi-ya, ma, le, ọ we dighachi ka anu-aru-ya. ) 8 O gēru kwa, ma ọ buru na ha ekweghi gi, ọ buru kwa na ha egeghi nti n'ọlụ ihe-iriba-ama mbu, na ha gēkwe ọlụ ihe-iriba-ama nke ikpe-azu. 9 O gēru kwa, ma ọ buru na ha ekweghi kwa ihe-iriba-ama abua ndia, ọ buru kwa na ha egeghi nti n'olu-gi, na i gēwere ufọdu nime miri nke osimiri Nail, wusi ya n'ala-akọrọ: miri ahu nke i nēweputa n'osimiri Nail gāghọ kwa ọbara, ọ gāghọ ọbara n'ala-akọrọ. 10 Moses we si Jehova, Biko, Onye-nwe-ayi, Ọ bughi onye-ọ̀kà-okwu ka m'bu, ma-ọbu na mb͕e gara aga, ma-ọbu site na mb͕e I gwara orù-Gi okwu: n'ihi na onye ọnu-ya di arọ́, nke ire-ya di kwa arọ́, ka m'bu. 11 Jehova we si ya, Ònye tiyeworo ọnu madu nwere? ma-ọbu ònye nēme madu ka ọ buru onye-ob͕i, ma-ọbu onye nti chiri, ma-ọbu onye nāhu uzọ, ma-ọbu onye-ìsì? Ọ̀ bughi Mu onwem, bú Jehova? 12 Ma ub͕u a, je, Mu onwem gānọyere ọnu-gi, zí gi ihe i gēkwu. 13 Ma ọ siri, Biko, Onye-nwe-ayi, biko, zìe n'aka onye I gēziga. 14 Iwe Jehova we di ọku n'aru Moses, Ọ we si, Ọ̀ nọghi, bú Eron nwa-nne-gi, bú onye Livai? amawom na ya onwe-ya nēkwu okwu nke-ọma. Ọzọ kwa, le, ya onwe-ya nāputa izute gi: ma mb͕e ọ huru gi, ọ gāṅuri n'obi-ya. 15 I gāgwa kwa ya okwu, tiye okwu ndia n'ọnu-ya: Mu onwem gānọye-kwa-ra ọnu-gi, nọye-kwa-ra ọnu-ya, zí kwa unu ihe ahu unu gēme. 16 Ya onwe-ya gāgwara gi ndim okwu: ọ gēru kwa, na ya onwe-ya gāburu gi ọnu, gi onwe-gi gābu-kwa-ra ya Chineke. 17 Ọ bu kwa nkpa-n'aka nka ka i gēwere n'aka-gi, nke i gēji me ihe-iriba-ama ndia. 18 Moses we je, laghachikuru Jetro, bú nna nwunye-ya, si ya, Biko, ka m'je, laghachikuru umu-nnem ndi nọ n'Ijipt, hu ma ha nọ ndu ub͕u a. Jetro we si Moses, Je n'udo. 19 Jehova we si Moses nime Midian, Je, laghachi n'Ijipt: n'ihi na ndikom ahu nile ndi nāchọ ndu-gi anwuruwo. 20 Moses we chiri nwunye-ya na umu-ya ndikom, me ka inyinya-ibu buru ha, ọ we laghachi n'ala Ijipt: Moses we were nkpa-n'aka Chineke n'aka-ya. 21 Jehova we si Moses, Mb͕e i je ilaghachi n'Ijipt, le anya ka i me n'iru Fero ihe-ebube nile nke M'tiyere n'aka-gi: ma Mu onwem gēme ka obi-ya di ike, ọ gaghi-ezipu kwa ndim. 22 I gāsi kwa Fero, Otú a ka Jehova siri, Nwam, bú ọkparam, ka Israel bu: 23 M'we si gi, Zipu nwam, ka ọ we fèm; i we ju izipu ya: le, Mu onwem gaje ib͕u nwa-gi, bú ọkpara-gi. 24 O rue, n'uzọ n'ebe inọ ọnọdu-abali, na Jehova zutere ya, chọ ime ka ọ nwua. 25 Zipora we were ọ́mú, bipu api nwa-ya, me ka ọ metu ukwu abua nke di-ya; Zipora we si, N'ezie di nke ọbara ka i bu n'ebe m'nọ. 26 Ọ we rapu ya ndu. Mb͕e ahu Zipora siri, Di nke ọbara ka i bu, bayere obibì-úgwù. 27 Jehova we si Eron, Jerue ọzara izute Moses. Ọ we je, zute ya n'ugwu Chineke, sutu ya ọnú. 28 Moses we gosi Eron okwu nile nke Jehova, bú nke O zitere ya ka o kwue, na ihe-iriba-ama nile Ọ nyere ya iwu ka ọ me. 29 Moses na Eron we je chikọta ndi-okenye nile nke umu Israel: 30 Eron we kwue okwu nile nke Jehova gwara Moses, ọ me kwa ihe-iriba-ama nile n'anya ndi Israel. 31 Ndi ahu we kwere: mb͕e ha nuru na Jehova letarari umu Israel, na Ọ hu-kwa-rari nweda-n'ala nke ha, ha rube isi kpọ isi ala.

Ọpupu 5

1 Emesia Moses na Eron biara, si Fero, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, nāsi, Zipu ndim, ka ha we merem ememe n'ọzara. 2 Fero we si, Ònye bu Jehova, na m'gēge nti n'olu-Ya izipu Israel? amaghm Jehova, ọzọ kwa, m'gaghi-ezipu Israel. 3 Ha si, Chineke nke ndi-Hibru ezutewo ayi: biko, ka ayi je ije nke ubọchi atọ n'ọzara, chuara Jehova, bu Chineke-ayi, aja: ka Ọ we ghara iwere ajọ ọria nēfe efe, ma-ọbu mma-agha, zute ayi. 4 Eze Ijipt we si ha, N'ìhi gini ka unu, bú Moses na Eron, nēme ka ndi ahu rapu ọlu-ha nile? jenu ibu-unu. 5 Fero si-kwa-ra, Le, ọtutu ka ndi ala nka di ub͕u a, unu nēme kwa ka ha kwusi n'ibu ibu nile ha. 6 N'ubọ-chi ahu Fero we nye ndi nāchi ndi Israel n'ihe-ike na ndi nēle ha anya n'ọlu iwu, si, 7 Unu enye-kwa-la ndi ahu okporo-ọka ọzọ ikpu brick, dika na mb͕e gara aga: ha onwe-ha gēje chikọtara onwe-ha okporo-ọka. 8 Ọnu-ọgugu brick, nke ha onwe-ha nākpu na mb͕e gara aga, ka unu gātukwasi ha; unu agubìla ihe nime ya: n'ihi na ndi-ume-ngwu ka ha bu; n'ihi ya ka ha onwe-ha nēti nkpu, si, Ka ayi je, chuara Chineke-ayi àjà. 9 Ka òfùfè-ha di arọ́ n'aru ndikom ahu, ka ha we lua ọlu nime ya; ha ele-kwa-la okwu-ugha anya ọma. 10 Ndi nāchi ndi Israel n'ihe-ike we pua, ha na ndi nēle ha anya n'ọlu, ha we gwa ndi ahu okwu, si, Otú a ka Fero siri, M'gaghi-adi nēnye unu okporo-ọka. 11 Unu onwe-unu je, werenu okporo-ọka n'onwe-unu n'ebe ọ bula unu gāchọta ya, n'ihi na ọ dighi ihe agāgubì n'òfùfè-unu. 12 Ndi Israel we b͕asa n'ala Ijipt nile ichikọta ahihia-ọka n'ọnọdu okporo-ọka. 13 Ndi nāchi ha n'ihe-ike nēme ngwa, si, Luzeunu ọlu-unu, ọlu nke ubọchi n'ubọchi-ya, dika mb͕e okporo-ọka di. 14 Ewe tie ha ihe, bú ndi nēle umu Israel anya n'ọlu, nke ndi Fero ndi nāchi umu Israel n'ihe-ike doro isi-ha, ewe si ha, Gini mere unu aluzughi òkè-unu ma nyahuru ma ta, n'ikpu brick dika na mb͕e gara aga? 15 Ndi nēle umu Israel anya n'ọlu we bia tikue Fero, si, N'ìhi gini ka i nēme ndi-orù-gi otú a? 16 Ọ dighi okporo-ọka anēnye ndi-orù-gi, ma ha nāsi ayi, Kpuanu brick: le kwa, anēti ndi-orù-gi ihe; ma ndi nke gi emehiewo. 17 Ma ọ siri, Ndi-ume-ngwu ka unu bu, ndi-ume-ngwu ka unu bu: n'ihi nka ka unu onwe-unu nāsi, Ka ayi je, chuara Jehova àjà. 18 Ma ub͕u a, jenu, fè òfùfè; n'ihi na agaghi-enye unu okporo-ọka, ma ọnu-ọgugu brick-unu ka unu gēnye. 19 Ndi nēle umu Israel anya n'ọlu we hu ha na ha nọ n'ọnọdu ọjọ mb͕e anāsi, Unu agubìla ihe nime brick-unu, ọlu nke ubọchi n'ubọchi-ya. 20 Ha we zute Moses na Eron, ndi nēguzo onwe-ha izute ha, mb͕e ha si n'ebe Fero nọ puta: 21 ha si ha, Jehova lekwasi unu anya, kpe ikpe: n'ihi na unu emewo ka ísì-ayi sì ísì ọjọ n'anya Fero, na n'anya ndi-orù-ya, itiye mma-agha n'aka-ha ib͕u ayi. 22 Moses we laghachikuru Jehova, si, Onye-nwe-ayi, n'ìhi gini ka I mejọworo ndi nka? ọ̀ bu n'ihi gini bu nka na I zitewom? 23 Ma site na mb͕e m'biakutere Fero ikwu okwu n'aha-Gi, ọ mejọwo ndi nka; I naputaghi kwa ndi-Gi ma-ọli.

Ọpupu 6

1 Jehova we si Moses, Ub͕u a ka i gāhu ihe M'gēme Fero: n'ihi na n'aka di ike ka o gēzipu ha, ọ bu kwa n'aka di ike ka ọ gāchupu ha n'ala-ya. 2 Chineke we gwa Moses okwu, si ya, Mu onwem bu JEHOVA: 3 eme-kwa-ram Abraham, me kwa Aisak, me kwa Jekob, ka ha hum anya dika Chineke Nke puru ime ihe nile, ma n'aham, bú JEHOVA, ka anēmeghi ka ha maram. 4 Ọzọ kwa, emewom ka ọb͕ub͕a-ndum guzosie ike n'ebe ha nọ, inye ha ala Kenean, bú ala ọnọdu-ọbìa nile ha, nke ha nọri dika ọbìa nime ya. 5 Ọzọ kwa, Mu onwem anuwo isu-ude umu Israel, ndi ndi Ijipt nēme ka ha buru orù; echetawokwam ọb͕ub͕a-ndum. 6 N'ihi ya si umu Israel, Mu onwem bu Jehova, M'gēme kwa ka unu si n'okpuru ibu nile nke ndi Ijipt pua, M'gānaputa kwa unu n'òfùfè-ha, were kwa ogwe-aka esetiri eseti, were kwa ikpé uku di iche iche, b͕aputa unu: 7 M'gēwere kwa unu n'Onwem ka unu buru otù ndi, M'gābu-kwa-ra unu Chineke: unu gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova Chineke-unu, Nke nēme ka unu si n'okpuru ibu nile nke ndi Ijipt puta. 8 M'gēme kwa ka unu bata n'ala ahu, nke M'weliri akam iwere ya nye Abraham, nye kwa Aisak, nye kwa Jekob; M'gēnye kwa unu ya ka ọ buru ihe-nnweta: Mu onwem bu Jehova. 9 Moses we gwa umu Israel okwu otú a: ma ha egeghi Moses nti site n'enweghi-ntachi-obi nime mọ-ha, site kwa n'òfùfè siri ike. 10 Jehova we gwa Moses okwu, si, 11 Bà gwa Fero, bú eze Ijipt, okwu, ka ọ we zipu umu Israel n'ala-ya. 12 Moses we kwue n'iru Jehova, si, Le, umu Israel egeghm nti; Fèro gēsi kwa aṅa nuru olum, onye mu onwem bu onye anēbighi úgwù n'eb͕ub͕ere-ọnu? 13 Jehova we gwa Moses na Eron okwu, nye ha iwu n'ebe umu Israel nọ, na n'ebe Fero eze Ijipt nọ, ime ka umu Israel si n'ala Ijipt pua. 14 Ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha: umu-ndikom Reuben, bú ọkpara Israel; Hanok, na Palu, na Hezron, na Kami: ndia bu ab͕uru Reuben. 15 Umu-ndikom Simeon kwa; Jemuel, na Jamin, na Ohad, na Jakin, na Zoha, na Shaul, bú nwa nke nwayi Kenean ahu: ndia bu ab͕uru Simeon. 16 Ndia bu kwa aha umu-ndikom Livai, dika osuso-ọmumu nile ha si di; Giashon, na Kohat, na Merari: arọ ndu Livai di ọgu arọ isi na iri na asa. 17 Umu-ndikom Giashon; Libni, na Shimai, dika ab͕uru nile ha si di. 18 Umu-ndikom Kohat kwa; Amram, na Izha, na Hebron, na Uziel: arọ ndu Kohat di ọgu arọ isi na iri na atọ. 19 Umu-ndikom Merari kwa; Mahli na Mushi. Ndia bu ab͕uru ndi Livai, dika osuso-ọmumu nile ha si di. 20 Amram we lutara onwe-ya Jokebed na nwunye, bú nwa-nne-nwayi nke nna-ya; ọ we muara ya Eron na Moses: arọ ndu Amram di ọgu arọ isi na iri na asa. 21 Umu-ndikom Izha kwa; Kora, na Nefeg, na Zikri. 22 Umu-ndikom Uziel kwa; Mishael, na Elzafan, na Sitri. 23 Eron we lutara onwe-ya Elisheba na nwunye, bú nwa-nwayi Aminadab, nwa-nne-nwayi Nahshon; ọ we muara ya Nedab, na Abaihu, na Eleeza, na Itama. 24 Umu-ndikom Kora kwa; Asia, na Elkena, na Abiasaf; ndia bu ab͕uru ndi Kora. 25 Eleeza nwa Eron we lutara onwe-ya otù nime umu-ndinyom Putiel, ọ we muara ya Finehas. Ndia bu ndi-isi nke ndi bu nna nke ndi Livai, dika ab͕uru nile ha si di. 26 Ndia bu Eron na Moses ahu, ndi Jehova siri, Menu ka umu Israel si n'ala Ijipt puta n'usu nile nke ndi-agha-ha. 27 Ha onwe-ha bu ndi nāgwa Fero eze Ijipt okwu, ime ka umu Israel si n'Ijipt pua: ndia bu Moses na Eron ahu. 28 O rue, n'ubọchi Jehova gwara Moses okwu n'ala Ijipt, 29 na Jehova gwara Moses okwu, si, Mu onwem bu Jehova: gwa Fero eze Ijipt okwu nile nke Mu onwem nāgwa gi. 30 Moses we si n'iru Jehova, Le, mu onwem bu onye anēbighi úgwù n'eb͕ub͕ere-ọnu, Fèro gēsi kwa aṅa gem nti?

Ọpupu 7

1 Jehova we si Moses, Le, emewom i ka i ghọrọ Fero chi: Eron, bú nwa-nne-gi, gābu kwa onye-amuma-gi. 2 Gi onwe-gi gēkwu ihe nile nke M'nēnye gi n'iwu: Eron nwa-nne-gi gāgwa kwa Fero okwu, ka ọ we zipu umu Israel n'ala-ya. 3 Ma Mu onwem gēme ka obi Fero sie ike, M'gēme kwa ka ihe-iriba-amam na ihe-ebubem di ọtutu n'ala Ijipt. 4 Ma Fero agaghi-ege unu nti, M'gētiye kwa akam n'aru ndi Ijipt, were kwa ikpé uku di iche iche me ka usu nile nke ndi-agha nkem, bú ndim umu Israel, si n'ala Ijipt puta. 5 Ndi Ijipt gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'gēseti akam n'aru ndi Ijipt, me ka umu Israel si n'etiti ha puta. 6 Moses na Eron we me ya; dika Jehova nyere ha iwu, otú a ka ha mere. 7 Moses b͕ara ọgu arọ anọ, Eron b͕a-kwa-ra ọgu arọ anọ na atọ, mb͕e ha gwara Fero okwu. 8 Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si, 9 Mb͕e Fero gāgwa unu okwu, si, Merenu onwe-unu ihe-ebube: i gāsi kwa Eron, Were nkpa-n'aka-gi, tuda ya n'iru Fero, ka ọ ghọ ogologo anu. 10 Moses na Eron we bakuru Fero, me otú a, dika Jehova nyere ha iwu: Eron we tuda nkpa-n'aka-ya n'iru Fero, na n'iru ndi-orù-ya, ọ we ghọ ogologo anu. 11 Fero we kpọ kwa ndi mara ihe, kpọ kwa ndi-mb͕asi: ha onwe-ha kwa, bú ndi-ode-akwukwọ di nsọ nke Ijipt, we were ihe-nzuzo di iche iche ha me otú a. 12 Ha we tuda, nwoke ọ bula nkpa-n'aka-ya, ha we ghọ ogologo anu: ma nkpa-n'aka Eron lodara nkpa-n'aka-ha. 13 Obi Fero we di ike, Ọ geghi kwa ha nti; dika Jehova kwuru. 14 Jehova we si Moses, Obi Fero di arọ́, ọ nāju izipu ndim. 15 Jekuru Fero n'ututu; le, ọ nāpu ije miri; i gēguzo onwe-gi n'usọ osimiri Nail izute ya; nkpa-n'aka ahu kwa nke b͕anwere ghọ agwọ, i gēwere ya n'aka-gi. 16 I gāsi kwa ya, Jehova, bú Chineke nke ndi-Hibru, O zìwom biakute gi, si, Zipu ndim, ka ha we fèm n'ọzara: ma, le, i nughi rue ub͕u a. 17 Otú a ka Jehova siri, Nime nka ka i gāmara na Mu onwem bu Jehova: le, mu onwem gaje iwere nkpa-n'aka nke di n'akam tikwasi miri nke di n'osimiri Nail, ọ gāb͕anwe ghọ ọbara. 18 Azù nke di n'osimiri Nail gānwu, osimiri Nail gēsì kwa ísì; ndi Ijipt gāsọ iṅu miri si n'osimiri Nail puta oyi. 19 Jehova we si Moses, Si Eron, Were nkpa-n'aka-gi setipu aka-gi n'elu miri nile nke Ijipt, n'elu osimiri nile ha, na n'elu osimiri Nail nile ha, na n'elu ọdọ-miri nile ha, na n'elu ebe-nchikọta-miri-ha nile, ka ha we ghọ ọbara; ọbara gādi kwa n'ala Ijipt nile, ma n'ihe nke osisi ma n'ihe nke nkume. 20 Moses na Eron we me otú a, dika Jehova nyere iwu; ọ we welie nkpa-n'aka ahu tie miri nke di n'osimiri Nail, n'anya Fero, na n'anya ndi-orù-ya; miri nile nke di n'osimiri Nail we b͕anwe ghọ ọbara. 21 Azù nke di n'osimiri Nail we nwua; osimiri Nail nēsì kwa ísì, ndi Ijipt apughi kwa iṅu miri si n'osimiri Nail puta; ọbara ahu we di n'ala Ijipt nile. 22 Ndi-ode-akwukwọ di nsọ nke Ijipt we were ihe-nzuzo di iche iche ha me otú a: obi Fero we di ike, ọ geghi kwa ha nti; dika Jehova kwuru. 23 Fero we chigharia, ba n'ulo-ya, ma o tiyeghi obi-ya ọbuná na nka. 24 Ndi Ijipt nile we gwue olùlù buruburu osimiri Nail inwe miri-ọṅuṅu; n'ihi na ha apughi iṅu miri osimiri Nail. 25 Ubọchi asa we zue, ka Jehova tisiri osimiri Nail ihe.

Ọpupu 8

1 Jehova we si Moses, Bakuru Fero, si ya, Otú a ka Jehova siri, Zipu ndim, ka ha we fèm. 2 Ma o buru na gi onwe-gi aju izipu ha, le, Mu onwem gaje iwere awọ tie ókè-ala-gi nile: 3 osimiri Nail gēnuputa awọ, nke gārigo ba n'ulo-gi, na n'ime-ulo-ndina-gi, na n'elu ihe-ndina-gi, na n'ulo ndi-orù-gi, na n'aru ndi-gi, na n'ite-ọku-gi nile, na n'ihe-gi i ji agwọ achicha: 4 ọ bu kwa n'aru gi, na n'aru ndi-gi, na n'aru ndi-orù-gi nile, ka awọ ahu gārigo. 5 Jehova we si Moses, Si Eron, Setipu aka-gi, ya na nkpa-n'aka-gi, n'elu osimiri nile, na n'elu osimiri Nail nile, na n'elu ọdọ-miri nile, me ka awọ rigota n'ala Ijipt. 6 Eron we setipu aka-ya n'elu miri nile nke Ijipt; awọ we rigo, kpuchie ala Ijipt. 7 Ndi-ode-akwukwọ di nsọ we were ihe-nzuzo-ha di iche iche me otú a, we me ka awọ rigo n'elu ala Ijipt. 8 Fero we kpọ Moses na Eron, si, Riọnu Jehova, ka O wezuga awọ n'ebe m'nọ, na n'ebe ndim nọ; m'gēzipu kwa ndi Israel, ka ha we chuara Jehova àjà. 9 Moses we si Fero, Nya isi n'arum: òle mb͕e ka m'gāriọrọ gi aririọ, riọ-kwa-ra ndi-orù-gi, riọ-kwa-ra ndi-gi, ka ekpochapu awọ n'ebe i nọ na n'ebe ulo-gi nile di? nání n'osimiri Nail ka ha gāfọdu. 10 Ọ si, Echi. Ọ si, Ya di ka okwu-gi si di: ka i we mara na ọ dighi onye di ka Jehova, bú Chineke-ayi. 11 Awọ gēwezuga onwe-ha n'ebe i nọ, na n'ebe ulo-gi nile di, na n'ebe ndi-orù-gi nọ, na n'ebe ndi-gi nọ; nání n'osimiri Nail ka ha gāfọdu. 12 Moses na Eron we si n'ebe Fero nọ pua: Moses we tikue Jehova ntiku bayere okwu awọ nke O dorori nye Fero. 13 Jehova we me dika okwu Moses si di; awọ we nwupu n'ulo nile, na n'ogige nile, na n'ubi nile. 14 Ha we chikọba ha n'obo n'obo: ala ahu we nēsì ísì. 15 Fero we hu na o bìwo, o we me ka obi-ya di arọ́, ọ geghi kwa ha nti; dika Jehova kwuru. 16 Jehova we si Moses, Si Eron, Setipu nkpa-n'aka-gi, tie ájá nke ala, ọ gāghọ kwa anwu ntà n'ala Ijipt nile. 17 Ha we me otú a; Eron we setipu aka-ya, ya na nkpa-n'aka-ya. tie ájá nke ala, anwu ntà ahu we di n'aru madu, na n'aru anumanu; ájá nile nke ala ghọrọ anwu ntà n'ala Ijipt nile. 18 Ndi-ode-akwukwọ di nsọ we were ihe-nzuzo-ha di iche iche me otú a, ime ka anwu ntà puta, ma ha apugh: anwu ntà ahu we di n'aru madu, na n'aru anumanu. 19 Ndi-ode-akwukwọ di nsọ we si Fero, Nkpisi-aka Chineke ka nka bu: obi Fero we di ike, ọ geghi kwa ha nti; dika Jehova kwuru. 20 Jehova we si Moses, Bilie n'isi-ututu, guzo onwe-gi n'iru Fero; le, ọ nāputa ije miri; i gāsi kwa ya, Otú a ka Jehova siri, Zipu ndim, ka ha we fèm. 21 N'ihi na, ma ọ buru na i dighi-ezipu ndim, le, M'gaje izite n'aru gi, na n'aru ndi-orù-gi, na n'aru ndi-gi, na nime ulo-gi nile, odudu: ulo nile nke ndi Ijipt gēju kwa n'odudu ahu, ya na ala nke ha di n'elu ya. 22 M'gēkewapu n'ubọchi ahu ala Goshen, nke ndim nēguzo n'elu ya, ya mere odudu agaghi-adi n'ebe ahu; ka i we mara na Mu onwem bu Jehova n'etiti uwa. 23 M'gētiye kwa nb͕aputa n'etiti ndim na ndi-gi: echi ka ihe-iriba-ama nka gādi. 24 Jehova we me otú a; odudu nke bara uba nke-uku we ba n'ulo Fero na ulo ndi-orù-ya: ọ bu kwa n'ala Ijipt nile ka ebibiri ala ahu n'ihi odudu. 25 Fero we kpọ Moses na Eron, si, Jenu, chuara Chineke-unu àjà n'ala nka. 26 Moses we si, O kwesighi ime otú a; n'ihi na ihe-árú ndi Ijipt ka ayi gēji chuara Jehova, bú Chineke-ayi, aja: le, àyi gēwere ihe-árú ndi Ijipt chu àjà n'anya-ha, ha agaghi-atub͕u kwa ayi na nkume? 27 Ije nke ubọchi atọ ka ayi gēje n'ọzara, chu-kwa-ra Jehova, bú Chineke-ayi, àjà, dika Ọ nāsi ayi me. 28 Fero we si, Mu onwem gēzipu unu, ka unu we chuara Jehova, bú Chineke-unu, àjà n'ọzara; ọ bu nání na unu agaghi-eje ebe di anya nke-uku: riọrọnum aririọ. 29 Moses we si, Le, Mu onwem nēsi n'ebe i nọ pua, m'gāriọ kwa Jehova ka odudu we wezuga onwe-ha n'ebe Fero nọ, na n'ebe ndi-orù-ya nọ, na n'ebe ndi-ya nọ, echi: ma ka Fero ghara ikwa emò ọzọ, n'ighara izipu ndi Israel ichuru Jehova àjà. 30 Moses we si n'ebe Fero nọ pua, we riọ Jehova. 31 Jehova we me dika okwu Moses si di; O we wezuga odudu n'ebe Fero nọ, na n'ebe ndi-orù-ya nọ, na n'ebe ndi-ya nọ; ọ dighi otù fọduru. 32 Fero we me kwa ka obi-ya di arọ́ na mb͕e ahu, o zipughi kwa ndi Israel.

Ọpupu 9

1 Jehova we si Moses, Bakuru Fero, gwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke ndi-Hibru, siri, Zipu ndim, ka ha we fèm. 2 N'ihi na, ma ọ buru na gi onwe-gi nāju izipu ha, ma i nējigide ha, 3 le, aka Jehova di n'aru anu-ulo-gi nke di n'ọhia, n'aru inyinya-gi nile, na n'aru inyinya-ibu-gi nile, na n'aru camel-gi nile, na n'aru ìgwè ehi-gi, na n'aru ìgwè ewu na aturu-gi: ajọ ọria nke nēfe efe, nke di arọ́ nke-uku, gādi. 4 Jehova gākpa ókè n'etiti anu-ulo Israel na anu-ulo Ijipt: ọ dighi ihe gānwupu n'ihe nile umu Israel nwere. 5 Jehova we debe mb͕e akara àkà, si, Echi ka Jehova gēme ihe a n'ala nka. 6 Jehova we me ihe ahu n'echi-ya, anu-ulo Ijipt nile we nwua: ma nime anu-ulo umu Israel ọ dighi otù nwupuru. 7 Fero we ziga, ma, le, ọ dighi ma ọbuná otù nwupuru nime anu-ulo Israel. Obi Fero we di arọ́, o zipughi kwa ndi Israel. 8 Jehova we si Moses na Eron, Kporonu n'onwe-unu ntu oké ọku nju aka abua, ka Moses wu kwa ya n'iru elu-igwe n'anya Fero. 9 Ọ gāghọ uzuzu ntà n'elu ala Ijipt nile, ọ gāghọ kwa etuto nāb͕apú nb͕apú n'aru madu na n'aru anumanu, n'ala Ijipt nile. 10 Ha we kporo ntu oké ọku, guzo n'iru Fero; Moses we wua ya n'iru elu-igwe; o we ghọ ihe etuto nāb͕apú nb͕apú n'aru madu na n'aru anumanu. 11 Ndi-ode-akwukwọ di nsọ apughi kwa iguzo n'iru Moses, n'ihi ihe-ofifi ahu; n'ihi na ihe-etuto ahu di n'aru ndi-ode-akwukwọ di nsọ, na n'aru ndi Ijipt nile. 12 Jehova we me ka obi Fero di ike, ọ geghi kwa ha nti; dika Jehova gwara Moses. 13 Jehova we si Moses, Bilie n'isi-ututu, guzo onwe-gi n'iru Fero, si ya, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke ndi-Hibru, siri, Zipu ndim, ka ha we fèm. 14 N'ihi na ọ bu na mb͕e a ka Mu gaje izite ihe-otitim nile n'obi-gi, na n'aru ndi-orù-gi, na n'aru ndi-gi; ka i we mara na ọ dighi onye di kam n'uwa nile. 15 N'ihi na ub͕u a M'gēsetipuwori akam, were ajọ ọria nēfe efe tib͕u gi na ndi-gi, ewe zopu gi n'uwa: 16 ma otú ọ di ọ bu n'ihi nka ka M'guzoworo gi, ka M'we me ka i hu ikem, ka ewe kọ kwa akukọ aham n'uwa nile. 17 Ì nọ nātuli onwe-gi elu dika obo-ihe imegide ndim rue ub͕u a, na i gaghi-ezipu ha? 18 Le, dika mb͕e a echi M'gaje ime ákú-miri-ígwé di arọ́ nke-uku ka o zo, nke ákú-miri-ígwé dika ya nādighi n'Ijipt site n'ubọchi atọrọ ntọ-ala-ya we rue ub͕u a. 19 Ma ub͕u a, ziga, me anu-ulo-gi na ndi nile i nwere n'ọhia ka ha laghachi n'ulo ọsọsọ; madu ọ bula na anumanu ọ bula nke agāhu n'ọhia, nke agaghi-achikọta ha n'ulo, ákú-miri-ígwé ahu gādakwasi ha, ha we nwua. 20 Onye nātu egwu okwu Jehova n'etiti ndi-orù Fero mere ndi-orù-ya na anu-ulo-ya ka ha b͕aghachi n'ulo: 21 ma onye nētiyeghi obi-ya n'okwu Jehova rapuru ndi-orù-ya na anu-ulo-ya n'ọhia. 22 Jehova we si Moses, Setipu aka-gi n'iru elu-igwe, ka ákú-miri-ígwé we di n'ala Ijipt nile, n'aru madu, na n'aru anumanu, na n'aru ihe-ọkukú ọ bula nke ubi, n'ala Ijipt. 23 Moses we setipu nkpa-n'aka-ya n'iru elu-igwe: Jehova we nye éb͕è-elu-igwe na ákú-miri-ígwé, ọku we nējeru ala; Jehova we me ka ákú-miri-ígwé zokwasi ala Ijipt. 24 Ákú-miri-ígwé we di, ọku nānwude kwa onwe-ya n'etiti ákú-miri-ígwé ahu, di arọ́ nke-uku, nke ihe dika ya nādighi n'ala Ijipt nile site na mb͕e ọ ghọrọ mba. 25 Ákú-miri-ígwé ahu we tib͕ue ihe nile nke di n'ọhia, ma madu ma anumanu, n'ala Ijipt nile; ọ bu kwa ihe-ọkukú nile ọ bula nke ubi ka ákú-miri-ígwé ahu tiri, ọ bu kwa osisi nile ọ bula nke ọhia ka o tipiara. 26 Nání n'ala Goshen, ebe umu Israel nọ, ka ákú-miri-ígwé nādighi. 27 Fero we zìe, kpọ Moses na Eron, si ha, Emehiewom ub͕u a: Jehova bu onye ezi omume, ma mu onwem na ndim bu ndi nēmebi iwu. 28 Riọnu Jehova; n'ihi na o zuwo, bú olu Chineke na ákú-miri-ígwé ndia; m'gēzipu kwa unu, unu agaghi-eguzo kwa ọzọ. 29 Moses we si ya, Mb͕e m'si n'obodo pua, M'gāb͕asara Jehova ọbu-akam abua; éb͕è-elu-igwe nile gākwusi, ákú-miri-ígwé agaghi-adi kwa ọzọ; ka i we mara na Jehova nwe uwa. 30 Ma gi onwe-gi na ndi-orù-gi, amawom na unu akātughi egwu iru Jehova, bú Chineke. 31 Eti-kwa-ra flax na ọka barley: n'ihi na ọka barley nāra oko, flax nāma ifuru. 32 Ma etighi ọka wheat na ọka spelt: n'ihi na ihe ahu etoghi. 33 Moses we si n'ebe Fero nọ, si n'obodo, pua, ọ we b͕asara Jehova ọbu-aka-ya abua: éb͕è-elu-igwe nile na ákú-miri-ígwé we kwusi, awusighi miri-ozuzo n'ala. 34 Fero we hu na miri-ozuzo na ákú-miri-ígwé na éb͕è-elu-igwe kwusiri, ọ we mehie ọzọ, me ka obi-ya di arọ́, ya na ndi-orù-ya. 35 Ewe me ka obi Fero di ike, o zipughi kwa umu Israel; dika Jehova kwuru site n'aka Moses.

Ọpupu 10

1 Jehova we si Moses, Bakuru Fero: n'ihi na Mu onwem emewo ka obi-ya na obi ndi-orù-ya di arọ́, ka M'we tiye ihe-iriba-ama ndia n'etiti ha: 2 ka i we kọ kwa na nti nwa-gi na nwa nwa-gi akukọ bayere emò M'kwara ndi Ijipt, na ihe-iriba-ama nile nke M'tiyere n'etiti ha; ka unu we mara na Mu onwem bu Jehova. 3 Moses na Eron we bakuru Fero, si ya, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke ndi-Hibru, siri, Rùe ole mb͕e i gāju iweda onwe-gi n'ala n'irum? zipu ndim, ka ha we fèm. 4 N'ihi na, ma ọ buru na i nāju izipu ndim, le, echi ka M'gaje ime ka igurube bata n'ókè-ala-gi: 5 ha gēkpuchi kwa iru ala, madu agaghi-enwe kwa ike ihu ala anya: ha gēri kwa ihe fọduru nke ihe arapuworo, nke fọduru unu site n'ákú-miri-ígwé, ha gēri kwa osisi nile ọ bula nke nēpuru unu epú site n'ọhia: 6 ulo-gi nile na ulo ndi-orù-gi nile na ulo ndi Ijipt nile gējuputa kwa; nke nna-gi-hà na nna nile nke nna-gi-hà nāhughi, site n'ubọchi ha nọ n'elu ala rue ta. Ọ we chigharia, si n'ebe Fero nọ pua. 7 Ndi-orù Fero we si ya, Rùe ole mb͕e ka nwoke a gāburu ayi ọnyà? zipu ndikom ahu, ka ha we fè Jehova, bú Chineke-ha: ì kāmaghi na Ijipt alawo n'iyì? 8 Ewe me ka Moses na Eron biaghachikute Fero: ọ si ha, Jenu, fè Jehova, bú Chineke-unu: ònye na onye bu ndi nēje? 9 Moses we si, Ayi na umu ntà ayi na ndi-agadi-ayi gāyikọ je, ayi na umu-ayi ndikom na umu-ayi ndinyom na ìgwè ewu na aturu-ayi na ìgwè ehi-ayi gāyikọ je; n'ihi na ememe Jehova ka ayi nwere. 10 Ọ si ha, Ka Jehova diyere unu otú a, dika m'gēzipu unu na umu-ntakiri-unu: lenu anya, n'ihi na ihe ọjọ di n'iru unu. 11 Ọ gaghi-ndi otú a: biko, jenu, unu, bú ndikom, fè Jehova; n'ihi na nke ahu ka unu onwe-unu nāchọ. Ewe chupu ha n'iru Fero. 12 Jehova we si Moses, Setipu aka-gi n'elu ala Ijipt iweta igurube, ka ha we rigota n'elu ala Ijipt, rie-ihe-ọkukú ọ bula nke ala, bú ihe nile nke ákú-miri-ígwé ahu rapuru. 13 Moses we setipu nkpa-n'aka-ya n'elu ala Ijipt, Jehova we dubata ifufe Iru-anyanwu n'ala ahu ehihie ahu nile na abali ahu nile: mb͕e o ruru ututu ifufe Iru-anyanwu ahu butere igurube. 14 Igurube we rigota n'elu ala Ijipt nile, be n'ókè-ala ọ bula nke Ijipt: ha di arọ́ nke-uku; tutu ha ọ dighi igurube di otú a, dika igurube ahu, mb͕e ha gasiri ọ gaghi-adi kwa igurube otú a. 15 Ha we kpuchie iru ala ahu nile, ala we b͕a ọchichiri; ha we rie ihe-ọkukú nile ọ bula nke ala ahu, na nkpuru nile nke osisi nke ákú-miri-ígwé rapuru: ọ dighi kwa akwukwọ ndu fọduru, n'osisi ma-ọbu n'ihe-ọkukú nke ubi, n'ala Ijipt nile. 16 Fero we me ngwa ikpọ Moses na Eron, si, Eme-hiewom megide Jehova, bú Chineke-unu, megide kwa unu. 17 Ma ub͕u a, biko, gbaghara nmehiem nání otù ub͕ò a, riọ-kwa-nu Jehova, bú Chineke-unu, ka Ọ we wezuga n'arum nání ọnwu a. 18 Ọ we si n'ebe Fero nọ pua, riọ Jehova aririọ. 19 Jehova we me ifufe Ọdida-anyanwu di ike nke-uku ka o chigharia, nke buru igurube, fere ha ga n'Oké Osimiri Uhie; ọ dighi otù igurube fọduru n'ókè-ala ọ bula nke Ijipt. 20 Ma Jehova mere ka obi Fero di ike, o zipughi kwa umu Israel. 21 Jehova we si Moses, Setipu aka-gi n'iru elu-igwe, ka ọchichiri we b͕a n'elu ala Ijipt, bú ọchichiri agēbitu aka. 22 Moses we setipu aka-ya n'iru elu-igwe; oké ọchichiri we di n'ala Ijipt nile ubọchi atọ; 23 ha ahuritaghi ibe-ha anya, ọ dighi kwa onye si n'ebe ọ nọ bilie ubọchi atọ: ma umu Israel nile nwere ìhè n'ebe-obibi nile ha. 24 Fero we kpọ Moses, si, Jenu, fè Jehova; nání ìgwè ewu na aturu-unu na ìgwè ehi-unu ka agēdebe: ka umu-ntakiri-unu so kwa unu je. 25 Moses we si, Gi onwe-gi gēnye kwa n'aka-ayi ihe àjà, na ihe àjà-nsure-ọku, ka ayi we mere Jehova, bú Chineke-ayi, ihe. 26 Ọzọ kwa, anu-ulo-ayi gēso ayi je; agaghi-arapu otù ukwu anu; n'ihi na ufọdu nime ha ka ayi gēwere fè Jehova, bú Chineke-ayi; ma ayi onwe-ayi amaghi ihe ayi gēji fè Jehova, rue mb͕e ayi gābia rue ebe ahu. 27 Ma Jehova mere ka obi Fero di ike, o kweghi kwa izipu ha. 28 Fero we si ya, Pua n'arum la, lezie onwe-gi anya, ahula irum ọzọ; n'ihi na n'ubọchi i huru irum ka i gānwu. 29 Moses we si, Nke-ọma ka i kwuworo; m'gaghi-ahu kwa iru-gi ọzọ.

Ọpupu 11

1 Jehova we si Moses, Otù ihe-otiti fọduru M'gēme ka ọ bia n'aru Fero na n'aru ndi Ijipt; emesia o gēsi n'ebe a zipu unu: mb͕e ọ nēzipuzu unu nile, ọ ghaghi ichupu unu n'ebe a. 2 Biko, kwue na nti ndim, ka ha riọ kwa, nwoke ọ bula n'aka nwoke-ibe-ya na nwayi ọ bula n'aka nwayi-ibe-ya, ihe ọla-ọcha na ihe ọla-edo. 3 Jehova we nye ndi Israel amara n'iru ndi Ijipt. Ọzọ, nwoke ahu, bú Moses, di uku ri nne n'ala Ijipt, n'anya ndi-orù Fero, na n'anya ndi ahu. 4 Moses we si, Otú a ka Jehova siri, Dika n'etiti abali Mu onwem ganāpu je n'etiti Ijipt: 5 umu nile eburu uzọ mu n'ala Ijipt gānwu kwa, site na nwa eburu uzọ muru Fero nke n-anọkwasi n'oche-eze-ya, we rue nwa o buru uzọ mu, bú nwayi nēje ozi nke nọ n'azu nkume-igwe-nri; na umu nile anumanu buru uzọ mu. 6 Oké iti-nkpu gādi kwa n'ala Ijipt nile, nke iti-nkpu dika ya akādighi, iti-nkpu dika ya agaghi-adi kwa ọzọ. 7 Ma imegide umu Israel nile nkita agaghi-araghari ire-ya, imegide madu ma-ọbu anumanu: ka unu we mara na Jehova nākpa ókè n'etiti ndi Ijipt na Israel. 8 Ndi-orù-gi ndia nile gārida-kutem, kpọ isi ala nyem, si, Pua, gi onwe-gi, na ndi nile nke nọ n'ukwu-gi: emesia m'gāpu. Ọ we si n'ebe Fero nọ pua n'iwe di ọku. 9 Jehova we si Moses, Fero agaghi-ege unu nti: ka ihe-ebubem we di ọtutu n'ala Ijipt. 10 Moses na Eron we me ihe-ebube ndia nile n'iru Fero: ma Jehova mere ka obi Fero di ike, o zipughi kwa umu Israel n'ala-ya.

Ọpupu 12

1 Jehova we gwa Moses na Eron okwu n'ala Ijipt, si, 2 Ọnwa nka gāburu unu isi ọnwa nile: ọnwa mbu nime ọnwa nile nke arọ ka ọ gāburu unu. 3 Gwanu nzukọ nile nke Israel okwu, si, N'ubọchi nke-iri nke ọnwa nka ka ha gēwere n'onwe-ha, onye ọ bula o were nwa-aturu, dika ulo nna-unu-hà si di, ka otù nwa-aturu diri otù ulo: 4 ma ọ buru na ulo ahu dikari ntà iri nwa-aturu, ya onwe-ya na onye-ab͕ata-obi-ya nke bi nso ulo-ya gēwere kwa otù dika ọnu-ọgugu madu si di; onye ọ bula dika oriri-ya si di, otú a ka unu gāguru nwa-aturu ahu ọgugu. 5 Nwa-aturu unu nwere gābu nke zuru okè, oké nke b͕ara otù arọ: n'etiti aturu ma-ọbu n'etiti ewu ka unu gēsi weputa ya: 6 ọ gābu-kwa-ra unu ihe-ndebe rue ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa nka: nkpọkọta nile nke nzukọ Israel gēb͕u ya n'etiti ehihie na anyasi. 7 Ha gēwere ufọdu nime ọbara-ya, tiyekwasi ya n'awara-uzọ abua na n'ọfiere-uzọ n'ulo nile nke ha gēri ya nime ha. 8 Ha gēri anu-aru-ya n'abali ahu, aruru n'ọku, ya na achicha ekoghi-eko; tiyere ihe di iche iche nēlu ilu ka ha gēri ya. 9 Unu erila ihe nime ya na ndu, ma-ọbu isi ya na miri ma-ọli, kama aruru n'ọkui; isi-ya tiyere ọlu-ukwu-ya na ọlu-aka-ya, tiye-kwa-ra ihe-ime-ya. 10 Unu agaghi-eme ka ihe ọ bula fọdu site na ya rue ututu; ma ihe fọduru site na ya rue ututu, n'ọku ka unu gēsure ya. 11 Otú a ka unu gēri ya; n'iji ihe-ọkiké ke n'úkwù-unu, na akpukpọ-ukwú-unu n'ukwù, na nkpa-n'aka-unu n'aka-unu: unu gēri kwa ya na ngwa: ngabiga nke diri Jehova ka ọ bu. 12 M'gāgabiga kwa n'ala Ijipt n'abali ahu, tib͕u nwa ọ bula eburu uzọ mu n'ala Ijipt, ma madu ma anumanu; ọ bu kwa n'aru chi nile nke Ijipt ka M'gēme ihe nile ekpere n'ikpe: Mu onwem bu Jehova. 13 Ọbara ahu gāburu unu ihe-iriba-ama n'aru ulo nile ebe unu onwe-unu nọ: mb͕e M'huru ọbara ahu, M'gāgabiga unu, ọ dighi kwa ihe-otiti gādi n'aru unu ibu ihe-nbibì, mb͕e M'nētib͕u ndi bi n'ala Ijipt. 14 Ubọchi a gāburu unu ihe-ncheta, unu gēme kwa ya ka ọ buru ememe unu nēmere Jehova: n'ọb͕ọ nile unu ka unu ganēme ya ka ọ buru ememe site n'ukpuru ebighi-ebi. 15 Ubọchi asa ka unu gēri achicha ekoghi-eko; ọ buná n'ubọchi mbu ka unu gēme ka ihe nēko achicha ghara idi n'ulo nile unu: n'ihi na onye ọ bula nke nēri achicha koro eko site n'ubọchi mbu rue ubọchi nke-asa, agēbipu madu ahu n'Israel. 16 N'ubọchi mbu nkpọkọta di nsọ gādi, n'ubọchi nke-asa nkpọkọta di nsọ gādi-kwa-ra unu; ọ dighi ozi ọ bula agēje nime ha, nání ihe onye ọ bula gēri, nání nke ahu ka unu gēme. 17 Unu gēdebe kwa ememe achicha ekoghi-eko; n'ihi na ọ bu nime otù ubọchi a ka M'meworo ka usu nile nke ndi-agha-unu si n'ala Ijipt puta: unu gēdebe kwa ubọchi a rue ọb͕ọ nile unu site n'ukpuru ebighi-ebi. 18 N'onwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu n'anyasi, ka unu gēri achicha ekoghi-eko, rue ubọchi nke-orú-na-otù nke ọnwa ahu n'anyasi. 19 Ubọchi asa ka anāgaghi-ahu ihe nēko achicha n'ulo nile unu: n'ihi na onye ọ bula nke nēri achicha koro eko, agēbipu madu ahu nime nzukọ Israel, ma n'etiti ndi-ọbìa, ma n'etiti ndi amuru n'ala. 20 Unu agaghi-eri achicha ọ bula koro eko; n'ebe-obibi-unu nile ka unu gēri achicha ekoghi-eko. 21 Moses we kpọ ndi-okenye nile nke Israel, si ha, Kpuputanu, chiri kwa ìgwè ewu na aturu n'onwe-unu, dika ab͕uru-unu nile si di, b͕u-kwa-nu anu ngabiga nka. 22 Unu gēwere kwa ùkwù hyssop, sue ya n'ọbara nke di n'ọkwa, were ya jua ọbara ufọdu nke di n'ọkwa elu-uzọ na n'awara-uzọ abua; unu onwe-unu agaghi-apu kwa, onye ọ bula n'ọnu-uzọ ulo-ya, rue ututu. 23 N'ihi na Jehova gāgabiga iti ndi Ijipt ihe; ma mb͕e Ọ huru ọbara ahu n'elu elu-uzọ na n'elu awara-uzọ abua, Jehova gāgabiga ọnu-uzọ ahu, Ọ gaghi-ekwe onye-nbibì ahu ka ọ ba n'ulo-unu iti unu ihe. 24 Unu gēdebe kwa ihe a ka ọ buru ukpuru n'ebe i nọ na n'ebe umu-gi nọ rue mb͕e ebighi-ebi. 25 O gēru kwa, mb͕e unu gābà n'ala ahu nke Jehova gēnye unu, dika O kwuworo, na unu gēdebe òfùfè a. 26 O gēru kwa, mb͕e umu-unu gāsi unu, Gini bu òfùfè a unu nwere? 27 na unu gāsi, Àjà ngabiga ka ọ bu nke anāchuru Jehova, Onye gabigara ulo nile nke umu Israel n'Ijipt, mb͕e O tiri ndi Ijipt ihe, O we naputa ulo nile ayi. Ndi Israel we rube isi, kpọ isi ala. 28 Umu Israel we je me ya; dika Jehova nyere Moses na Eron iwu, otú a ka ha mere. 29 O rue, n'etiti abali, na Jehova tib͕uru nwa ọ bula eburu uzọ mu n'ala Ijipt, site na nwa eburu uzọ muru Fero nke nānọkwasi n'oche-eze-ya rue nwa eburu uzọ muru onye adọtara n'agha nke nọ n'ulo olùlù; O tib͕u-kwa-ra nwa anumanu ọ bula eburu uzọ mu. 30 Fero we bilie n'abali, ya onwe-ya, na ndi-orù-ya nile, na ndi Ijipt nile; oké iti-nkpu we di n'Ijipt; n'ihi na ọ dighi ulo ebe onye nwuru anwu nādighi. 31 O we kpọ Moses na Eron n'abali, si, Bilienu, si n'etiti ndim pua, ma unu onwe-unu ma umu Israel; je-kwa-nu, fè Jehova, dika unu kwuru. 32 Chirinu ma ìgwè ewu na aturu-unu ma ìgwè ehi-unu, dika unu kwuru, jenu; gọzi-kwa-num. 33 Ndi Iiipt we di ike n'aru ndi Israel izipu ha n'ala-ha ngwa ngwa; n'ihi na ha siri, Ayi nile bu ndi nwuru anwu. 34 Ndi Israel we buru utu ọka flour-ha agwọrọ agwọ tutu o ko, ebe ekere ihe-ha eji agwọ achicha n'uwe-nb͕okwasi-ha tukwasi n'ubu-ha. 35 Umu Israel me-kwa-ra dika okwu Moses si di; ha we riọ n'aka ndi Ijipt ihe ọla-ọcha, na ihe ọla-edo, na uwe-nb͕okwasi: 36 Jehova we nye ndi Israel amara n'iru ndi Ijipt, ha we me ka ha riọta ihe. Ha we napu ndi Ijipt ihe-ha. 37 Umu Israel we bulie ije site na Rameses rue Sukot, ihe ra ka orú nnù ndikom ọgu uzọ atọ na orú nnù uzọ iri-na-ise, ndi ji ukwu eje, bú ndikom, nāgughi umu-ntakiri. 38 Ọzọ kwa, ọtutu ndi gwara ọgwa soro ha rigo; na ìgwè ewu na aturu, na ìgwè ehi, anu-ulo riri nne nke-uku. 39 Ha we were utu ọka flour agwọrọ agwọ, bú nke ha si n'Ijipt bute, sie achicha ekoghi-eko, n'ihi na o koghi eko; n'ihi na achupuru ha n'Ijipt, ha apughi kwa inọ ọdù, ọzọ kwa, ọ dighi ihe iri n'uzọ ha doziri onwe-ha. 40 Ma obibi umu Israel, nke ha biri n'Ijipt, di nnù arọ na orú arọ na iri. 41 O rue, n'ọgwugwu nnù arọ na orú arọ na iri ahu, ọ bu kwa n'otù ubọchi ahu ka o ruru, na usu nile nke ndi-agha Jehova siri n'ala Ijipt pua. 42 Abali nche ka ọ buru Jehova ime ka ha si n'ala Ijipt puta: otù abali ahu bu abali nche diri Jehova nke umu Israel nile nwere rue ọb͕ọ nile ha. 43 Jehova we si Moses na Eron, Nka bu ukpuru ngabiga ahu: ọ dighi onye ala ọzọ gēri ya: 44 ma orù ọ bula nke onye ọ bula, bú nke ejiri ego b͕ata, mb͕e i bìworo ya úgwù, mb͕e ahu o gēri ya. 45 Onye-nnọdu na onye egoro ọlu agaghi-eri ya. 46 N'otù ulo ka agēri ya; i gaghi-esi n'ulo wepu ihe ọ bula n'anu-aru-ya n'èzí; ọ dighi kwa ọkpukpu unu gētiji nime ya. 47 Nzukọ nile nke Israel gēme ya. 48 Ma mb͕e ọbìa gānọ n'ala-gi dika ọbìa, mb͕e ọ gēme-kwa-ra Jehova ememe ngabiga, ka ebìe nwoke ọ bula ọ nwere úgwù, mb͕e ahu ya biarue nso ime ya; ọ gādi kwa ka onye amuru n'ala: ma ọ dighi onye ọ bula anēbighi úgwù gēri ya. 49 Otù iwu ka ha gēnwe, bú onye amuru n'ala na ọbìa nke nọ dika ọbìa n'etiti unu. 50 Umu Israel nile we me ya; dika Jehova nyere Moses na Eron iwu, otú a ka ha mere. 51 O rue, n'otù ubọchi ahu, na Jehova mere ka umu Israel si n'ala Ijipt puta n'usu nile nke ndi-agha-ha.

Ọpupu 13

1 Jehova we gwa Moses okwu, si, 2 Dorom nwa ọ bula eburu uzọ mu nsọ, bú nwa meghere àkpà-nwa ọ bula n'etiti umu Israel, ma n'etiti madu ma n'etiti anumanu: nkem ka ọ bu. 3 Moses we si ndi Israel, Cheta ubọchi a, nke ọ bu nime ya ka unu siworo n'Ijipt, n'ulo ndi-orù, puta; n'ihi na ike nke aka ka Jehova ji me ka unu si n'ebe a puta: agaghi-eri kwa achicha koro eko. 4 Ta ka unu onwe-unu nāputa n'ọnwa Ebib. 5 O gēru kwa, mb͕e Jehova gēme gi ka i ba n'ala nke ndi Kenean na ndi Het na ndi-Amorait na ndi-Haivait na ndi Jebus, nke Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi inye gi, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya, na i gēfè òfùfè a n'ọnwa nka. 6 Ubọchi asa ka i gēri achicha ekoghi-eko, ma n'ubọchi nke-asa ememe di agēmere Jehova. 7 Achicha ekoghi-eko ka agēri n'ubọchi asa ahu; agaghi-ahu kwa achicha koro eko n'aka-gi, agaghi-ahu kwa ihe nēko achicha n'aka-gi n'ókè-ala-gi nile. 8 I gēgosi kwa nwa-gi n'ubọchi ahu, si, Ọ bu n'ihi ihe ahu Jehova merem mb͕e m'siri n'Ijipt puta. 9 Ọ gabu-kwa-ra gi ihe-iriba-ama n'elu aka-gi, na ihe-ncheta n'etiti anya-gi abua, ka iwu Jehova we di n'ọnu-gi: n'ihi na aka di ike ka Jehova jiri me ka i si n'Ijipt puta. 10 I gēdebe kwa ukpuru a na mb͕e-ya akara àkà kwa-arọ. 11 O gēru kwa, mb͕e Jehova gēme ka i ba n'ala ndi Kenean, dika Ọ ṅuru gi na nna-gi-hà iyi, mb͕e Ọ gēnye kwa gi ya, 12 na i gēme ka nwa ọ bula nke meghere àkpà-nwa gabigara Jehova, ya na nwa ọ bula meghere àkpà-nwa, bú nwa anu-ulo muru, nke i nwere; ndi bu oké ka Jehova gēnwe. 13 Ma nwa ọ bula nke inyinya-ibu nke meghere àkpà-nwa, i gēwere nwa-aturu b͕aputa ya; ma ọ buru na i b͕aputaghi ya, i gāb͕aji kwa olu-ya: ọkpara ọ bula nke madu n'etiti umu-gi ka i gab͕aputa kwa. 14 O gēru kwa, mb͕e nwa-gi gāju gi n'ọdi-n'iru, si, Gini bu nka? na i gāsi ya, Ike nke aka ka Jehova jiri me ka ayi si n'Ijipt, n'ulo ndi-orù, puta: 15 o rue, mb͕e Fero mere ka o sie ike, bú izipu ayi, na Jehova b͕uru nwa ọ bula eburu uzọ mu n'ala Ijipt, ma nwa madu buru uzọ mu, ma nwa anumanu buru uzọ mu: n'ihi nka ka mu onwem nēwere nwa ọ bula meghere àkpà-nwa, bú oké, chuara Jehova àjà; ma ọkpara ọ bula nke umum, anamab͕aputa ya. 16 Ọ gābu kwa ihe-iriba-ama n'elu aka-gi, na nkpọ-n'iru n'etiti anya-gi abua: n'ihi na ike nke aka ka Jehova jiri me ka ayi si n'Ijipt puta. 17 O rue, mb͕e Fero zipuru ndi Israel, na Chineke edughi ha n'uzọ ala ndi Filistia, ọ bu ezie na nke ahu di nso; n'ihi na Chineke siri, Ka ndim we ghara icheghari uche mb͕e ha huru agha, we laghachi n'Ijipt: 18 ma Chineke dughariri ndi Israel, n'uzọ ọzara, n'uzọ Oké Osimiri Uhie: umu Israel chiri ihe-ekike-agha si n'ala Ijipt rigoputa. 19 Moses we buru ọkpukpu Josef mb͕e ọ jere: n'ihi na ọ mere ka umu Israel ṅusie iyi ike, ọ si, Chineke gēleta unu n'ezie; unu gēme kwa ka ọkpukpum so unu si n'ebe a rigopua. 20 Ha we si na Sukot bulie ije-ha, ma ulo-ikwū-ha n'Itam, na nsọtu ọzara. 21 Ma Jehova nēje n'iru ha n'ehihie n'ogidi igwe-oji, iduru ha n'uzọ; na n'abali n'ogidi ọku, inye ha ìhè; ka ha we nēje ehihie na abali: 22 ogidi igwe-oji ahu n'ehihie, na ogidi ọku ahu n'abali, adighi-apu n'iru ndi Israel.

Ọpupu 14

1 Jehova we gwa Moses okwu, si, 2 Gwa umu Israel ka ha chigharia, ma ulo-ikwū-ha n'iru Pai-hahairot, n'etiti Migdol na oké osimiri, n'iru Beal-zefon: na ncherita-iru ya ka unu gāma ulo-ikwū-unu n'akuku oké osimiri. 3 Fero gēkwu kwa okwu bayere umu Israel, si, Ndi atuhiworo n'ala ka ha bu, ọzara emechibidowo ha nime. 4 M'gēme kwa ka obi Fero di ike, ọ gāchu kwa ha n'azu; agāsọpuru-kwam n'aru Fero na n'aru usu-ndi-agha-ya nile; ndi Ijipt gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova. Ha we me otú a. 5 Ewe gosi eze Ijipt na ndi Israel ab͕alagawo: obi Fero na ndi-orù-ya we chigharia imegide ndi Israel, ha si, Gini bu nka ayi meworo, na ayi ezipuwo Israel n'ifè ayi? 6 Ọ we jikere ub͕ọ-ala-ya, chiri kwa ndi-ya iso ya: 7 o chiri kwa nnù ub͕ọ-ala na ọgu iri arọputaworo, na ub͕ọ-ala nile nke Ijipt, na ndi-isi-agha n'elu ha nile. 8 Jehova we me ka obi Fero, bú eze Ijipt, di ike, ọ we chu umu Israel n'azu: umu Israel nēwere kwa aka di elu pua. 9 Ndi Ijipt we nāchu ha n'azu, bú inyinya nile nke ub͕ọ-ala nile nke Fero, na ndi-inyinya-ya, na usu-ndi-agha-ya, we rue ha aru ka ha nāma ulo-ikwū-ha n'akuku oké osimiri, n'akuku Pai-hahairot, n'iru Beal-zefon. 10 Fero we biarue nso, umu Israel we welie anya-ha, ma, le, ndi Ijipt nebuli ije n'azu ha; ha we tua egwu nke-uku: umu Israel we tikue Jehova. 11 Ha si Moses, Ọ̀ bu n'ihi na ílì adighi n'Ijipt na i chipuwo ayi inwu n'ọzara? gini bu nka i meworo ayi, n'ime ka ayi si n'Ijipt puta? 12 Ọ̀ bughi nka bu okwu nke ayi gwara gi n'Ijipt, si, Rapu ayi, ka ayi we fè ndi Ijipt? N'ihi na ọ di ayi nma ifè ndi Ijipt, kari inwu n'ọzara. 13 Moses we si ndi Israel, Unu atula egwu, guzonu onwe-unu n'ebe a, hu nzọputa Jehova, nke Ọ gēmere unu ta: n'ihi na ndi Ijipt ndi unu huworo ta, unu agaghi-ahu kwa ha ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi. 14 Jehova gēburu unu agha, ma unu onwe-unu gāb͕a nkiti. 15 Jehova we si Moses, Gini mere i nētikum? gwa umu Israel ka ha bulie ije. 16 Gi onwe-gi weli kwa nkpa-n'aka-gi elu, setipu aka-gi n'elu oké osimiri, kewa ya: umu Israel gābà kwa n'etiti oké osimiri n'ala-akọrọ. 17 Ma Mu onwem, le, M'nēme ka obi ndi Ijipt di ike, ha gēso kwa ha n'azu ba: agāsọ-purukwam n'aru Fero, na n'aru usu-ndi-agha-ya nile, n'aru ub͕ọ-ala-ya nile, na n'aru ndi-inyinya-ya. 18 Ndi Ijipt gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e agāsọpurum n'aru Fero, na n'aru ub͕ọ-ala-ya nile, na n'aru ndi-inyinya-ya. 19 Mọ-ozi nke Chineke, nke nēje n'iru ọmuma-ulo-ikwū nke Israel, we bulie ije, je n'azu ha; ogidi igwe-oji ahu we si n'iru ha bulie ije, guzo n'azu ha: 20 ọ we bata n'etiti ọmuma-ulo-ikwū Ijipt na ọmuma-ulo-ikwū Israel; igwe-oji ahu na ọchichiri ahu we di, ma ọ nēnye ìhè n'abali: otù abiarughi kwa nso ibe-ya n'abali ahu nile. 21 Moses we setipu aka-ya n'elu oké osimiri; Jehova we were ifufe Iru-anyanwu di ike me ka oké osimiri ahu je n'azu n'abali ahu nile, Ọ we me oké osimiri ahu ka ọ buru ala-akọrọ, ewe kewa miri ahu. 22 Umu Israel we ba n'etiti oké osimiri ahu n'elu ala-akọrọ ahu: miri ahu we ghọrọ ha mb͕idi n'aka-nri-ha, na n'aka-ekpe-ha. 23 Ndi Ijipt we nāchu ha, so ha ba n'etiti oké osimiri, bú inyinya Fero nile, na ub͕ọ-ala-ya, na ndi-inyinya-ya. 24 O rue, nime iche-nche ututu, na Jehova lere ọmuma-ulo-ikwū ndi Ijipt anya n'ogidi ọku na igwe-oji, chusa ọmuma-ulo-ikwū ndi Ijipt. 25 O wezuga akpuru ukwu nke ub͕ọ-ala-ha, me ka ọ di ha arọ́ ime ka ha nāga: ndi Ijipt we si, Ka ayi b͕apu n'iru Israel; n'ihi na Jehova nēburu ha agha megide ndi Ijipt. 26 Jehova we si Moses, Setipu aka-gi n'elu oké osimiri, miri ahu gālata kwa n'aru ndi Ijipt, n'aru ub͕ọ-ala-ha, na n'aru ndi-inyinya-ha. 27 Moses we setipu aka-ya n'elu oké osimiri, oké osimiri ahu we lata n'orùrù o nērù mb͕e nile mb͕e chi bọrọ; ndi Ijipt we nāb͕apu n'ọbibia-ya; Jehova we richapu ndi Ijipt n'etiti oké osimiri. 28 Miri ahu we lata, kpuchie ub͕ọ-ala nile, na ndi-inyinya, bú usu-ndi-agha nile nke Fero, ndi nēso ha n'azu ba nime oké osimiri; ọ dighi ma ọ buná otù onye fọduru nime ha. 29 Ma umu Israel jere ije n'elu ala-akọrọ n'etiti oké osimiri; miri ahu we ghọrọ ha mb͕idi n'aka-nri-ha na n'aka-ekpe-ha. 30 Jehova we zọputa Israel n'aka ndi Ijipt n'ubọchi ahu; Israel we hu ndi Ijipt ka ha nwuru anwu n'usọ oké osimiri. 31 Israel we hu aka uku nke Jehova ji megide ndi Ijipt, ndi Israel we tua egwu Jehova, kwere na Jehova, na n'orù-Ya Moses.

Ọpupu 15

1 Mb͕e ahu Moses na umu Israel nābukuru Jehova abù a, ha kwue, si, Ka m'bukue Jehova abù, n'ihi na O biliwo elu nke-uku: Inyinya na onye o nēbu, Ọ tubàwo ha n'oké osimiri. 2 Ikem na abù ọmam ka Ja bu, Ọ we ghọrọm nzọputa: Onye a bu Chinekem, m'gēme kwa Ya ka Ọ di elu; Chineke nke nnam, m'gēweli kwa Ya elu. 3 Jehova bu onye-agha: Jehova bu aha-Ya. 4 Ub͕ọ-ala Fero nile na usu-ndi-agha-ya ka O tufuworo n'oké osimiri: Ndi-isi-agha-ya arọputara arọputa, ha emikpuwo emikpu n'Oké Osimiri Uhie. 5 Ob͕u-miri nēkpuchi ha: Ha aridawo na miri di omìmì dika nkume. 6 Jehova, aka-nri-Gi, nke di ebube n'ike, Jehova, aka-nri-Gi nētipia onye-iro. 7 N'idi-ọtutu nke nbili-elu-Gi ka I nākwada ndi nēbili megide Gi: I nēzipu iwe-Gi di ọku, o richapu ha dika ahihia-ọka. 8 Ewere iku-ume nke oghere-imi-Gi me ka miri tua obo, Nrurù-miri guzoro onwe-ha ọtọ dika obo; Ob͕u-miri raruru aruru n'obi oké osimiri. 9 Onye-iro siri, M'gāchu, m'gēru ha aru, m'gēkesa ihe m'kwatara: Nkpuru-obim gējuputa na ha, M'gāmipu mma-agham, akam gā-napu ha ihe nile. 10 I were ifufe-Gi fe, oké osimiri kpuchiri ha: Ha mikpuru dika opù nime miri di ebube. 11 Ònye di ka Gi n'etiti chi nile, Jehova? Ònye di ka Gi, di ebube n'idi-nsọ? Onye anātu egwu n'otuto nile, nēme ihe-ebube di iche iche. 12 I setiri aka-nri-Gi, Ala elo ha. 13 N'ebere-Gi ka I duworo ndi nke I b͕aputaworo: N'ike-Gi ka I duworo ha nwayọ rue ebe-obibi-Gi di nsọ. 14 Ndi ọzọ anuwo, ha ama jijiji: Ihe-nb͕u eb͕uwo ndi bi na Filistia. 15 Mb͕e ahu ka obi lọrọ ndi-isi Edom miri: Ebulu nke Moab, ọma-jijiji nējide ha: Ndi nile bi na Kenean ab͕azewo. 16 Oké ujọ na oké egwù nādakwasi ha; N'idi-uku nke ogwe-aka-Gi ha nọ jū dika nkume; Rue mb͕e ndi-Gi gāgabiga, Jehova, Rue mb͕e ndi nke I nwetara gāgabiga. 17 I gēme ka ha bata, I gāku kwa ha n'ugwu nke ihe-nketa-Gi, Bú ọnọdu guzosiri ike I meworo, ka ọ we buru ebe I gēbi, Jehova, Ebe di nsọ, Onye-nwe-ayi, nke aka-Gi abua meworo ka o guzosi ike. 18 Jehova gābu eze rue mb͕e nile ebighi-ebi. 19 N'ihi na inyinya nile nke Fero, ha na ub͕ọ-ala-ya nile na ndi-inyinya-ya, bara nime oké osimiri, Jehova we me ka miri nke oké osimiri lata n'aru ha; ma umu Israel jere ije n'elu ala-akọrọ n'etiti oké osimiri. 20 Miriam, bú nwayi-amuma, bú nwa-nne-nwayi Eron, we were egwú-otiti n'aka-ya; ndinyom nile we chiri egwú-otiti na ite-egwú soro ya pua. 21 Miriam we za ha, si, Unu bukue Jehova abù, n'ihi na O biliwo elu nke-uku; Inyinya na onye o nēbu, Ọ tubàwo ha n'oké osimiri. 22 Moses we me ka Israel si n'Oké Osimiri Uhie bulie ije, ha we pua ba n'ọzara Shua; ha we je ije ubọchi atọ n'ọzara ahu, ma ha achọtaghi miri. 23 Ha we biarue Mara, ma ha apughi iṅu miri nke Mara, n'ihi na ilu ka ha di: n'ihi nka akpọrọ aha-ya Mara. 24 Ndi Israel we tamu ntamu megide Moses, si, Gini ka ayi gāṅu? 25 Ọ we tikue Jehova; Jehova we me ka ọ hu otù osisi, ọ tubà ya na miri ahu, miri ahu we di utọ. N'ebe ahu ka O doro ukpuru na ikpé nye ha, ọ bu kwa n'ebe ahu ka Ọ nwara ha; 26 si, Ọ buru na i ge nti nke-ọma n'olu Jehova, bú Chineke-gi, ọ buru kwa na i me ihe nke ziri ezi n'anya-Ya, ọ buru kwa na i ṅa nti n'ihe Ọ nyere n'iwu, ọ buru kwa na i debe ukpuru-Ya nile, ọ dighi ọria ọ bula nke M'tiyere n'aru ndi Ijipt M'gētiye n'aru gi: n'ihi na Mu onwem bu Jehova Nke nēme ka aru di gi nma. 27 Ha biarue Ilim, ebe isi-iyi iri na abua na ọgu nkwu atọ na iri di: ha we ma ulo-ikwū-ha n'ebe ahu n'akuku miri.

Ọpupu 16

1 Ha si n'Ilim bulie ije, nzukọ nile nke umu Israel we ba n'ọzara Sin, nke di n'etiti Ilim na Sainai, n'ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa nke-abua site n'ọpupu-ha n'ala Ijipt. 2 Nzukọ nile nke umu Israel we tamu ntamu megide Moses, megide kwa Eron, n'ọzara ahu: 3 umu Israel we si ha, Ọ gādi ayi nọ̄ nma ma asi na ayi nwururi n'aka Jehova n'ala Ijipt, mb͕e ayi nọduru n'akuku ite anu, mb͕e ayi rijuru nri afọ; n'ihi na unu emewo ka ayi puta ba n'ọzara nka, iwere agu me ka nkpọkọta nka nile nwua. 4 Jehova we si Moses, Le, M'gaje ime ka nri si n'elu-igwe zoro unu dika miri; ndim gāpu, chikọta ihe nke otù ubọchi n'ubọchi-ya, ka M'we nwa ha, ma ha gēje ije n'iwum, ma-ọbu na ha agaghi-eje. 5 O gēru kwa, n'ubọchi nke-isi, na ha gēdozi ihe nke ha nāchibata, ọ gēme kwa okpukpu abua nke ha nāchikọta kwa-ubọchi. 6 Moses na Eron we si umu Israel nile, n'anyasi ka unu gāmara na Jehova emewo ka unu si n'ala Ijipt puta: 7 n'ututu ka unu gāhu kwa ebube nke Jehova; ebe Ọ nānu ntamu nile unu nātamu megide Jehova: ma àyi onwe-ayi bu gini, na unu nātamu ntamu megide ayi? 8 Moses we si, Nka gābu mb͕e Jehova gēnye unu anu n'anyasi ka unu rie, mb͕e Ọ gēnye kwa unu nri n'ututu ka unu riju afọ; ebe Jehova nānu ntamu unu onwe-unu nātamu megide Ya: ma àyi onwe-ayi bu gini? ha abughi imegide ayi, bú ntamu unu nātamu, kama imegide Jehova. 9 Moses we si Eron, Si nzukọ nile nke umu Israel, Biarunu nso n'iru Jehova: n'ihi na Ọ nuwo ntamu nile unu. 10 O rue, mb͕e Eron nāgwa nzukọ nile nke umu Israel okwu, na ha chere ọzara iru, ma, le, ahuru ebube Jehova n'igwe-oji ahu. 11 Jehova we gwa Moses okwu, si, 12 Anuwom ntamu nile nke umu Israel: gwa ha okwu, si, N'etiti ehihie na anyasi ka unu gēri anu, n'ututu ka unu gēriju kwa afọ na nri; unu gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu. 13 O rue, n'anyasi, na nnunu quail rigotara, kpuchie ebe ọmuma-ulo-ikwū-ha: n'ututu igirigi we dikwasi n'ala buru-buru ọmuma-ulo-ikwū. 14 Mb͕e igirigi nke dikwasi n'ala rigoro, le, n'elu ọzara imurimu ihe nke ekpere ekpè, imurimu ihe dika hoar frost nke di n'elu ala. 15 Umu Israel we hu ya, sirita onwe-ha, Gini ka ọ bu? n'ihi na ha amaghi ihe ọ bu. Moses si ha, Nke ahu bu nri nke Jehova nyeworo unu ka unu rie. 16 Nka bu ihe Jehova nyere n'iwu, Chikọtanu ufọdu nime ya, onye ọ bula dika oriri-ya si di; otù ọtùtù omer otù isi, dika ọnu-ọgugu madu-unu si di, ka unu gēwere ya, onye ọ bula o were ndi nọ n'ulo-ikwū-ya. 17 Umu Israel we me otú a, chikọta, otù onye nāchikọta ri nne, nke-ọzọ nāchikọta nke ntà. 18 Ha we were omer tùa ya, onye chikọtara ri nne enweghi kari nke gēzuru ya, onye chikọta-kwa-ra nke ntà, ọ dighi ihe fọduru ya inwe; onye ọ bula dika oriri-ya si di, otú a ka ha chikọtara. 19 Moses we si ha, Ka onye ọ bula ghara ime ka ufọdu nime ya fọdu rue ututu. 20 Ma ha egeghi Moses nti; madu ufọdu nime ha we me ka ufọdu nime ya fọdu rue ututu, o we b͕a ikpuru, nēsì ísì: Moses we we iwe n'aru ha. 21 Ha we nāchikọta ya kwa-ututu, onye ọ bula dika oriri-ya si di: ma mb͕e anyanwu di ọku ọ b͕aze. 22 O rue, n'ubọchi nke-isi, na ha chikọtara nri okpukpu abua, ha nwere omer abua n'otù n'otù: ndi-isi nile nke nzukọ we bia, gosi Moses. 23 Ọ si ha, Nke ahu bu ihe Jehova kwuworo, si, Idebe-ubọchi-izu-ike, bú ubọchi-izu-ike di nsọ nye Jehova, ka echi bu: ihe unu nēghe, ghenu ya, ihe unu nēsi kwa, sienu ya; ma ihe nile nke fọduru, dọbaranu onwe-unu ya, ka ọ buru ihe-ndebe rue ututu. 24 Ha we dọba ya rue ututu, dika Moses nyere iwu: ma o sìghi ísì, ikpuru adighi kwa nime ya. 25 Moses we si, Rienu ya ta; n'ihi na ubọchi-izu-ike diri Jehova ka ta bu: ta unu agaghi-achọta ya n'ọhia. 26 Ubọchi isi ka unu gāchikọta ya; ma n'ubọchi nke-asa ka ubọchi-izu-ike di, ọ dighi nke gādi nime ya. 27 O rue, n'ubọchi nke-asa, na ufọdu nime ndi Israel puru apu ichikọta, ma ha achọtaghi. 28 Jehova we si Moses, Rùe ole mb͕e ka unu nāju idebe ihe nile M'nyere n'iwu na iwum nile? 29 Lenu, n'ihi na Jehova enyewo unu ubọchi-izu-ike, n'ihi nka Ya onwe-ya nēnye unu nri nke ubọchi abua n'ubọchi nke-isi; nọdunu, onye ọ bula n'ebe ọ nọ, ka onye ọ bula ghara isi n'ọnọdu-ya pua n'ubọchi nke-asa. 30 Ndi Israel we kwusi ilu ọlu n'ubọchi nke-asa. 31 Ulo Israel we kpọ aha-ya Manna: ihe ahu di ka nkpuru coriander, ọ di ọcha; idetu ya ire ọ di ka achicha wafer eji manu-aṅu me. 32 Moses we si, Nka bu ihe Jehova nyeworo n'iwu, si, Ka nju omer nime ya buru ihe-ndebe anēdebere ọb͕ọ nile unu; ka ha we hu nri M'mere ka unu rie n'ọzara, mb͕e M'mere ka unu si n'ala Ijipt puta. 33 Moses we si Eron, Were otù ite, tiye nju omer nke manna nime ya, dọba ya n'iru Jehova ka ọ buru ihe-ndebe anēdebere ọb͕ọ nile unu. 34 Dika Jehova nyere Moses iwu, otú a ka Eron dọbara ya n'iru Ihe-àmà, ka ọ buru ihe-ndebe. 35 Umu Israel we rie manna ahu ọgu arọ abua, rue mb͕e ha batara n'ala ebí ebí; manna ahu ka ha riri, rue mb͕e ha batara na nsọtu ala Kenean. 36 Ma omer, otù uzọ n'uzọ iri nke ọtùtù ephah ka ọ bu.

Ọpupu 17

1 Nzukọ nile nke umu Israel we si n'ọzara Sin bulie ije, na nbuli-ije nile ha, n'okwu-ọnu Jehova, ha we ma ulo-ikwū-ha na Refidim: ma ọ dighi miri ndi Israel gāṅu. 2 Ndi Israel we so Moses se okwu, si, Nyenu ayi miri ka ayi ṅua. Moses we si ha, Gini mere unu som nēse okwu? gini mere unu nānwa Jehova? 3 Akpiri miri we kpọ ndi Israel nku n'ebe ahu; ndi ahu we tamu ntamu megide Moses, si, ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka i meworo ka ayi si n'Ijipt rigota, iwere akpiri-ikpọ-nku me ka ayi na umu-ayi na anu-ulo-ayi, nwua? 4 Moses we tikue Jehova, si, Gini ka m'gēme ndi nka? ọ fọduru ihe ntà ka ha tub͕uem na nkume. 5 Jehova we si Moses, Gabiga n'iru ndim, chiri kwa ufọdu nime ndi-okenye Israel ka ha so gi je; nkpa-n'aka-gi kwa, nke i ji ti osimiri Nail, were ya n'aka-gi, je. 6 Le, M'gaje iguzo n'iru gi n'ebe ahu n'elu oké nkume nime Horeb, i gēti oké nkume ahu ihe, miri gēsi kwa nime ya puta, ka ndim we ṅua. Moses we me otú a n'anya ndi-okenye Israel. 7 O we kpọ aha ebe ahu Masa, na Meriba, n'ihi ise-okwu nke umu Israel, na n'ihi na ha nwara Jehova, si, Jehova, Ọ̀ nọ n'etiti ayi, ma-ọbu na Ọ nọghi? 8 Amalek we bia, buso Israel agha nime Refidim. 9 Moses we si Joshua, Rọputara ayi ndikom, pua, buso Amalek agha; echi mu onwem ganēguzo onwem n'elu ugwu ntà nka, nējide nkpa-n'aka Chineke n'akam. 10 Joshua we me dika Moses siri ya, ibuso Amalek agha: ma Moses na Eron na Hua rigoro n'elu ugwu ntà ahu. 11 O rue, mb͕e Moses weliri aka-ya elu, na Israel kariri ike: ma mb͕e o mere ka aka-ya zuru ike, Amalek kariri ike. 12 Ma aka Moses abua di arọ́; ha we were nkume, tiye ya n'okpuru ya, ọ nọkwasi ya; Eron na Hua we jide aka-ya abua elu, otù onye n'otù akuku, ibe-ya n'akuku ọzọ; aka-ya abua we nēguzosi ike rue ọdida-anyanwu. 13 Joshua we me ka ike gwu Amalek n'ọnu mma-agha. 14 Jehova we si Moses, De nka n'akwukwọ, ka ọ buru ihe-ncheta, me kwa ka ọ ba na nti Joshua: n'ihi na M'gēhichapusi ncheta Amalek n'okpuru elu-igwe. 15 Moses we wue ebe-ichu-àjà, kpọ aha-ya Jehova-nisi: 16 ọ si, Aka dikwasi oche-eze Ja, agha ka Jehova gēbuso Amalek site n'ọb͕ọ rue ọb͕ọ.

Ọpupu 18

1 Ma Jetro, bú onye-nchu-àjà Midian, nna nwunye Moses, nuru ihe nile Chineke mere Moses na Israel ndi-Ya, na Jehova mere ka Israel si n'Ijipt puta. 2 Jetro, bú nna nwunye Moses, we were Zipora, bú nwunye Moses, mb͕e o zipusiri ya, 3 na umu-ya ndikom abua; nke aha otù nime ha bu Giashom; n'ihi na ọ siri, Ọbìa ka m'buworo n'ala ọzọ: 4 aha nke ibe-ya bu kwa Elieza; n'ihi na ọ siri, Chineke nke nnam bu iye-akam, Ọ we naputam na mma-agha Fero: 5 Jetro, bú nna nwunye Moses, we biakute Moses, ya na umu-ya ndikom na nwunye-ya, nime ọzara ebe ya onwe-ya maworo ulo-ikwū, n'ugwu nke Chineke. 6 Ọ si Moses, Mu onwem, nna nwunye-gi, bú Jetro, abiakutewom i, mu na nwunye-gi, na umu-ya ndikom abua tiyere ya. 7 Moses we pua izute nna nwunye-ya, we kpọ isi ala, sutu kwa ya ọnu; ha we jurita onwe-ha ma ha nọ n'udo; ha we ba n'ulo-ikwū. 8 Moses we kọrọ nna nwunye-ya akukọ ihe nile Jehova mere Fero na ndi Ijipt n'ihi Israel, ike-ọgwugwu nile nke gwuru ha n'uzọ, Jehova we naputa ha. 9 Jetro we ṅuria ọṅu bayere ezi ihe nile nke Jehova mere Israel, ndi ọ naputara n'aka ndi Ijipt. 10 Jetro we si, Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, Onye naputaworo unu n'aka ndi Ijipt, na n'aka Fero; Onye naputaworo ndi nka n'okpuru aka ndi Ijipt. 11 Ub͕u ka m'mara na Jehova di uku kari chi nile: e, n'ihe nke ha di nganga megide ha. 12 Jetro, bú nna nwunye Moses, we were àjà-nsure-ọku na àjà di iche iche ichuru Jehova: Eron we bia, ya na ndi-okenye nile nke Israel, iso nna nwunye Moses ri nri n'iru Chineke. 13 O rue, n'echi-ya, na Moses nọduru ala ikpe ndi Israel ikpe: ndi ahu we guzo n'akuku Moses si n'ututu rue anyasi. 14 Nna nwunye Moses we hu ihe nile nke Moses onwe-ya nēme ndi Israel, ọ we si, Gini bu ihe a nke gi onwe-gi nēme ndi nka? gini mere gi onwe-gi nānọdu ala nání gi iche, ma ndi nka nile nēguzo onwe-ha n'akuku gi si n'ututu rue anyasi? 15 Moses we si nna nwunye-ya, N'ihi na ndi nka nābiakutem iju Chineke ase: 16 mb͕e ha nwere okwu, ha abiakutem; m'nēkpe kwa ikpe n'etiti madu na ibe-ya, m'nēme kwa ka ha mara ukpuru nile nke Chineke, na iwu-Ya nile. 17 Nna nwunye Moses we si ya, Ọ dighi nma, bú ihe gi onwe-gi nēme. 18 I ghaghi ikpọnwu akpọnwu dika akwukwọ, ma gi onwe-gi ma ndi nka gi na ha nọ: n'ihi na ọ di arọ́ kari gi, bú ihe a; i pughi ime ya nání gi iche. 19 Ub͕u a ge nti n'olum, m'gādu gi ọdu, ka Chineke nọyere kwa gi: gi onwe-gi buru ndi nka na ncherita-iru Chineke, gi onwe-gi webata-kwa-ra Chineke okwu nile, 20 me kwa ka ha ghọta ukpuru nile na iwu nile, gi me kwa ka ha mara uzọ ha gēje ije nime ya, na ọlu nke ha gālu. 21 Gi onwe-gi gēsi kwa na ndi nka nile leputa ndi-dìnkpà, ndi nātu egwu Chineke, ndi nēkwu ezi-okwu, ndi nākpọ urù nēzighi ezi asì; i gēdo kwa ndi ahu n'isi ha, ibu ndi-isi nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri, na ndi-isi ọgu ise ọgu ise, na ndi-isi ọgu abua na iri ọgu abua na iri, na ndi-isi iri iri: 22 ka ha kpe ndi nka na mb͕e nile: o gēru, na oké okwu nile ọ bula ka ha gēwetara gi, ma ha onwe-ha gēkpe okwu ntà nile ọ bula: gi me ka ọ di kari nfe n'aru gi, ha gēso kwa gi buru ibu a. 23 Ọ buru na ihe a ka i gēme, ọ buru kwa na Chineke enye gi iwu, i gēnwe kwa ike iguzo; ọzọ kwa, ndi nka nile gābà kwa n'ọnọdu-ha n'udo. 24 Moses we ge nti n'olu nna nwunye-ya, me ihe nile ọ siri. 25 Moses we si n'etiti Israel nile rọputa ndi-dìnkpà, me ha ka ha buru ndi-isi ndi ahu, ndi-isi nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri, na ndi-isi ọgu ise ọgu ise, na ndi-isi ọgu abua na iri ọgu abua na iri, na ndi-isi iri iri. 26 Ha we kpe ndi Israel ikpe na mb͕e nile: okwu nile nke siri ike ka ha nēwetara Moses, ma ha onwe-ha nēkpe okwu ntà nile. 27 Moses we zipu nna nwunye-ya; o we je nke ya, la n'ala-ya.

Ọpupu 19

1 N'ọnwa nke-atọ mb͕e umu Israel putasiri n'ala Ijipt, n'ubọchi ahu ka ha batara n'ọzara Sainai. 2 Ha we si na Refidim bulie ije, bata n'ọzara Sainai, we ma ulo-ikwū-ha n'ọzara ahu; Israel we ma ulo-ikwū-ha n'ebe ahu n'iru ugwu ahu. 3 Moses we rigokuru Chineke, Jehova we si n'ugwu ahu kpọ ya òkù, si, Otú a ka i gāsi ulo Jekob, gosi kwa umu Israel; 4 Unu onwe-unu ahuwo ihe M'mere ndi Ijipt, ebu-kwa-ram unu n'elu nkù ugo, me ka unu biakutem. 5 Ma ub͕u a, ọ buru na unu ege nti n'olum n'ezie, ọ buru kwa na unu edebe ọb͕ub͕a-ndum, unu gābu-kwa-ram ihe nke akam kari ndi nile: n'ihi na ọ bu Mu nwe uwa nile: 6 unu onwe-unu gābu-kwa-ram ala-eze ndi-nchu-àjà, na mba di nsọ. Ndia bu okwu nke i gāgwa umu Israel. 7 Moses we bia, kpọ ndi-okenye ndi Israel, tiye okwu ndia nile n'iru ha, bú nke Jehova nyere ya n'iwu. 8 Ndi Israel nile we za n'otù, si, Ihe nile Jehova kwuru, ayi gēme ya. Moses we weghachiri Jehova okwu nile nke ndi ahu. 9 Jehova we si Moses, Le, Mu onwem nābiakute gi n'igwe-oji b͕ara ọchichiri, ka ndim we nu mb͕e M'nākpa-yere gi uka, ọzọ kwa, ka ọ we buru gi onwe-gi ka ha gēkwere rue mb͕e ebighi-ebi. Moses we gosi Jehova okwu nile nke ndi Israel. 10 Jehova we si Moses, Jekuru ndim, do ha nsọ ta na echi, ka ha su kwa uwe-nb͕okwasi-ha, 11 nọ na njikere nye ubọchi nke-atọ: n'ihi na ọ bu n'ubọchi nke-atọ ka Jehova gāridata n'anya ndi Israel nile n'elu ugwu Sainai. 12 I gākpara ndim ókè buruburu, si, Lezienu onwe-unu anya, ka unu ghara irigo n'ugwu a, ma ọbu imetu nsọtu-ya aka: onye ọ bula nke nēmetu ugwu a aka, aghaghi ime ka ọ nwua: 13 ọ dighi aka gēmetu ya, n'ihi na aghaghi itub͕u ya na nkume, ma-ọbu ib͕ab͕u ya n'àkú; ma anumanu ma madu, ọ gaghi-adi ndu: n'ọfùfù-opì di anya ndi ahu gārigota n'ugwu a. 14 Moses we si n'ugwu ahu ridakuru ndi Israel, do ndi ahu nsọ; ha we su uwe-nbokwasi-ha. 15 Ọ si ndi Israel, Nọnu na njikere nye ubọchi nke-atọ: unu abiarula nwayi nso. 16 O rue, n'ubọchi nke-atọ, mb͕e ọ bu ututu, na ọtútú éb͕è-elu-igwe na àmùmà di, na igwe-oji di arọ́ n'elu ugwu ahu, na olu opì-ike di ike nke-uku; ndi Israel nile ndi nọ n'ọmuma-ulo-ikwū-ha we ma jijiji. 17 Moses we me ka ndi Israel si n'ọmuma-ulo-ikwū-ha puta izute Chineke, ha we guzo onwe-ha n'ala-ala nke ugwu ahu. 18 Ugwu Sainai nile nākwu anwurù, n'ihi na Jehova ridakwasiri ya n'ọku: anwurù-ya we kwugo dika anwurù nke oké ọku, ugwu ahu nile we ma jijiji nke-uku. 19 Olu opì-ike ahu we nādasi ike nke-uku, Moses nēkwu okwu, Chineke were kwa olu nāza ya. 20 Jehova we rida-kwasi ugwu Sainai, rue elu ugwu ahu: Jehova we kpọ Moses ibiaru elu ugwu ahu, Moses we rigo. 21 Jehova we si Moses, Rida, b͕ara ndim àmà, ka ha we ghara inujuru n'ebe Jehova nọ ile anya, ọtútú nime ha we da. 22 Ọzọ kwa, ndi-nchu-àjà, ndi nābiakute Jehova nso, ka ha do onwe-ha nsọ, ka Jehova we ghara itiwakuru ha. 23 Moses we si Jehova, Ndi-Gi apughi irigoru ugwu Sainai: n'ihi na Gi onwe-gi b͕ara ayi àmà, si, Kpara ugwu a ókè, do kwa ya nsọ. 24 Jehova si ya, Je, rida; i gārigota kwa, gi onwe-gi, na Eron tiyere gi: ma ka ndi-nchu-àjà na ndim ghara inujuru irigokute Jehova, ka O we ghara itiwakuru ha. 25 Moses we ridakuru ndi Israel, si ha me otú a.

Ọpupu 20

1 Chineke we kwue okwu ndia nile, si, 2 Mu onwem bu Jehova Chineke-gi, Onye mere ka i si n'ala Ijipt, n'ulo ndi-orù, puta. 3 Gi enwela Chi ọzọ tiyerem. 4 Gi emerela onwe-gi arusi apiri api, ma-ọbu oyiyi nke udi ọ bula nke di n'elu-igwe n'elu, ma-ọbu nke di n'uwa n'okpuru ya, ma-ọbu nke di na miri n'okpuru uwa: 5 gi akpọla isi ala nye ha, efè-kwa-la ha òfùfè: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova Chineke-gi, bu Chineke ekworo, nēwere ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ, nke ndi nākpọm asì; 6 ma anamemere nnù umu-umu abua na ọgu iri ebere, bú nke ndi nāhum n'anya, nēdebe kwa ihe nile M'nyere n'iwu. 7 Gi eburula aha Jehova, bú Chineke-gi, ime ihe efu; n'ihi na Jehova agaghi-agu onye nēburu aha-Ya ime ihe efu n'onye ikpé nāmaghi. 8 Cheta ubọchi-izu-ike, ido ya nsọ. 9 Ubọchi isi ka i gālu ọlu, je ozi-gi nile: 10 ma ubọchi nke-asa bu ubọchi-izu-ike nke Jehova, bú Chineke-gi, nwere: i gaghi-eje ozi ọ bula nime ya, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na anu-ulo-gi, na ọbìa-gi nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula: 11 n'ihi na n'ubọchi isi ka Jehova mere elu-igwe na uwa, na oké osimiri, na ihe nile nke di nime ha, Ọ we zuru ike n'ubọchi nke-asa: n'ihi nka ka Jehova gọziri ubọchi-izu-ike, do kwa ya nsọ. 12 Sọpuru nna-gi na nne-gi: ka ubọchi-gi we di anya n'elu ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi. 13 Gi eb͕ula madu. 14 Gi akwala iko. 15 Gi ezula ori. 16 Gi ab͕ala àmà ugha megide madu-ibe-gi. 17 Gi enwela anya-uku n'ebe ulo madu-ibe-gi di, gi enwela anya-uku n'ebe nwunye madu-ibe-gi nọ, ma-ọbu n'ebe orù-ya nwoke nọ, ma-ọbu n'ebe orù-ya nwayi nọ, ma-ọbu n'ebe ehi-ya di, ma-ọbu n'ebe inyinya-ibu-ya di, ma-ọbu n'ebe ihe ọ bula di nke madu-ibe-gi nwere. 18 Ndi Israel nile we nāhu éb͕è-elu-igwe nile, na ire-ọku nile, na olu opì-ike ahu, na ugwu ahu ka ọ nākwu anwurù: mb͕e ndi ahu huru ya ha we ṅaghari, guzo n'ebe di anya. 19 Ha si Moses, Gi onwe-gi kpayere ayi uka, ayi gānu kwa: ma Chineke akpayerela ayi uka, ka ayi we ghara inwu. 20 Moses we si ndi Israel, Unu atula egwu: n'ihi na ọ bu inwa unu ka Chineke biaworo, ya na ka egwù-Ya we di n'iru unu, ka unu we ghara imehie. 21 Ndi Israel we guzo n'ebe di anya, ma Moses biaruru oké ọchichiri ahu nso, ebe Chineke nọ. 22 Jehova we si Moses, Otú a ka i gāsi umu Israel, Unu onwe-unu ahuwo na esiwom n'elu-igwe kpayere unu uka. 23 Unu emela chi ọzọ tiyerem; chi ọla-ọcha ma-ọbu chi ọla-edo, unu emerela onwe-unu ha. 24 Ebe-ichu-àjà nke ájá ka i gēmerem, chu kwa àjà-nsure-ọku-gi nile na àjà-udo-gi nile n'elu ya, bú ìgwè ewu na aturu-gi, na ìgwè ehi-gi: n'ebe nile ọ bula ebe M'nēme ka echeta aham, n'ebe ahu ka M'gābiakute gi, gọzi kwa gi. 25 Ma ọ buru na ebe-ichu-àjà nke nkume ka i gēmerem, ewerela nkume awara awa wu ya: n'ihi na asi na i mewo ka ihe-ọlu-gi ga n'elu ya, i we me ka ọ ghara idi nsọ. 26 Ewerela ihe-nrigo rigo n'ebe-ichu-àjàm, ka ewe ghara ikpughe ọtọ-gi n'elu ya.

Ọpupu 21

1 Ma ndia bu ikpé nke i gētiye n'iru ha. 2 Mb͕e i b͕ata orù, bú onye-Hibru, arọ isi ka ọ gābu orù-gi: ma n'arọ nke-asa ọ gāpu nwere onwe-ya n'efu. 3 Ọ buru na ọ bata nání ya, ọ gāpu nání ya: ọ buru na onye nwere nwunye ka ọ bu, nwunye-ya gēso kwa ya pua. 4 Ọ buru na onye-nwe-ya enye ya nwunye, nwayi ahu ewe muara ya umu-ndikom ma-ọbu umu-ndinyom; nwayi ahu na umu-ya gābu ihe onye-nwe-ya nwere, ma ọ gapu nání ya. 5 Ma ọ buru na orù ahu asi n'ezie, Ahurum onye-nwem na nwunyem na umum n'anya; m'gaghi-apu nwere onwem: 6 onye-nwe-ya gēme kwa ka ọ biakute Chineke nso, ọ gēme kwa ka ọ biarue nso ọnu-uzọ, ma-ọbu nso awara-uzọ; onye-nwe-ya gēwere arà rapue nti-ya; ọ gābu kwa orù-ya rue mb͕e ebighi-ebi. 7 Ma mb͕e nwoke gēre nwa-ya nwayi ka ọ buru orù-nwayi, ọ gaghi-apu dika ọpupu orù-ndikom. 8 Ọ buru na ọ jọ njọ n'anya onye-nwe-ya, bú onye kwere na ya onwe-ya gālu ya na nwunye, ọ gēkwe kwa ka ab͕aputa ya: ọ gaghi-enwe ike ire ya nye ndi ala ọzọ, n'ihi na ọ ghọb͕uru ya. 9 Ma ọ buru na ọ kwere na nwa-ya nwoke gālu ya, dika ihe ekpere n'ikpe bayere umu-ndinyom si di, otú a ka ọ gēme ya. 10 Ọ buru na ọ lutara ya nwunye ọzọ; ọ gaghi-ewebì anu-oriri-ya, na ihe-nb͕okwasi-ya, na ihe kwesiri ya dika nwunye. 11 Ma ọ buru na ọ meghi ihe atọ ndia nye ya, ọ gāpu kwa n'efu, nēnyeghi ego. 12 Onye nētib͕u madu, ọ we nwua, aghaghi ime ka ọ nwua. 13 Ma onye nēcheghi anwu, ma Chineke mere ka ọ dabà n'aka-ya; M'gēdoro gi ebe ọ gāb͕alaga. 14 Ma mb͕e onye ọ bula gēwere nganga biakwasi ibe-ya, ib͕u ya n'aghughọ; n'ebe-ichu-àjàm ka i gēwepu ya ka ọ nwua. 15 Onye nēti nna-ya, ma-ọbu nne-ya, ihe, aghaghi ime ka ọ nwua. 16 Onye nēzu madu n'ori re ya, ma-ọbu na asi na ahu ya n'aka-ya, aghaghi ime ka ọ nwua. 17 Onye nākọcha nna-ya, ma-ọbu nne-ya, aghaghi ime ka ọ nwua. 18 Mb͕e ndikom nēse okwu, ma otù nime ha ewere nkume ma-ọbu iwere ọkpọ ti ibe-ya, ma ọ nwughi, ma o dina n'ihe-ndina ọria: 19 ma ọ buru na o bilie, jeghari n'èzí, dabere na nkpa-n'aka-ya, agāgu onye tiri ya n'onye ikpé nāmagh: ọ bu nání na ọ gēnye ya ihe bayere nb͕uru-ya, me kwa ka aru-ya di ike nke-ọma. 20 Mb͕e onye ọ bula gēwere nkpa-n'aka ti orù-ya nwoke, ma-ọbu orù-ya nwayi, ọ we nwua n'okpuru aka-ya; aghaghi ibọ ọ́bọ̀-ya n'aru ya. 21 Ma otú ọ di, ọ buru na otù ubọchi ma-ọbu ubọchi abua ka ọ gānọru, agaghi-abọ ọ́bọ̀-ya n'aru ya: n'ihi na ego-ya ka ọ bu. 22 Mb͕e ndikom nālu ọgu, we tie nwayi di ime ihe, ime-ya we pua, ma ajọ ihe aputagh: aghaghi iri ya nra, dika di nwayi ahu gātukwasi ya; ọ gēnye kwa site n'aka ndi-ikpé. 23 Ma ọ buru na ajọ ihe aputa, i gēme kwa ka ndu lara ndu, 24 anya lara anya, ezé lara ezé, aka lara aka, ukwu lara ukwu, 25 ida-ọku lara ida-ọku, ob͕ub͕u-mma lara ob͕ub͕u-mma, ufiri-utari lara ufiri-utari. 26 Mb͕e onye ọ bula gēti anya orù-ya nwoke, ma-ọbu anya orù-ya nwayi, ihe, we bibie ya; o gēzipu kwa ya ka ọ nwere onwe-ya n'ihi anya-ya. 27 Ọ buru kwa na ọ me ka ezé orù-ya nwoke ma-ọbu ezé orù-ya nwayi dapu; ọ gēzipu kwa ya ka o nwere onwe-ya n'ihi ezé-ya. 28 Mb͕e ehi gāsọ nwoke ma-ọbu nwayi mpì, o we nwua, aghaghi itub͕u ehi ahu na nkume, agaghi-eri kwa anu-ya; ma agāgu onye-nwe ehi ahu n'onye ikpe nāmaghi. 29 Ma ọ buru na ehi ahu bu ehi nāsọ mpì na mb͕e gara aga, ewe b͕ara onye-nwe-ya àmà, ma o debeghi ya nke-ọma, kama o mere ka nwoke ma-ọbu nwayi nwua; agātub͕u ehi ahu na nkume, ọzọ kwa, agēme ka onye-nwe-ya nwua. 30 Ọ buru na ihe ikpuchi nmehie-ya ka agātukwasi ya, ọ gēnye ihe-nb͕aputa nke ndu-ya, dika ihe nile agātukwasi ya si di. 31 Ma ọ bu nwa-nwoke ka ọ sọrọ mpì, ma ọ bu nwa-nwayi ka ọ sọrọ mpì, dika ikpé a si di ka agēme ya. 32 Ọ buru na orù-nwoke ma-ọbu orù-nwayi ka ehi ahu sọrọ mpì; orú shekel ọla-ọcha na iri ka ọ gēnye onye-nwe-ya, agātub͕u kwa ehi ahu. 33 Mb͕e onye ọ bula gēmeghe olùlù, ma-ọbu mb͕e onye ọ bula gēgwu olùlù, ghara imechi ya, ehi ma-ọbu inyinya-ibu ewe dabà nime ya, 34 onye-nwe olùlù ahu gākwughachi ihe; ego ka ọ gēnyeghachi onye-nwe-ya, nke nwuru anwu gābu kwa nke aka ya. 35 Mb͕e ehi onye ọ bula gēmeru ehi nke madu-ibe-ya aru, ọ we nwua; ha gēre kwa ehi di ndu, kè ego-ya: ọzọ kwa, nke nwuru anwu ka ha gēkè. 36 Ma-ọbu asi na amara na ehi ahu bu ehi nāsọ mpì na mb͕e gara aga, ma onye-nwe-ya edebeghi ya nke-ọma; ọ ghaghi ikwughachi ehi n'ọnọdu ehi ahu, nke nwuru anwu gābu kwa nke aka ya.

Ọpupu 22

1 Mb͕e onye ọ bula gēzu ehi ma-ọbu aturu, we b͕ue ya, ma-ọbu re ya; ehi ise ka ọ gākwughachi n'ọnọdu ehi ahu, ma-ọbu aturu anọ ka ọ gākwughachi n'ọnọdu aturu ahu. 2 Ọ buru na ahú onye-ori ka ọ nētipú ulo, ewe tib͕ue ya, o we nwua, ọ dighi ikpe-ọmuma ọbara gādi bayere ya. 3 Ọ buru na anyanwu awakwasi ya, ikpe-ọmuma ọbara gādi bayere ya: ọ ghaghi ikwu-ghachi; ọ buru na o nweghi ihe, agēre kwa ya n'ihi ori-ya. 4 Ọ buru na achọta ihe ahu n'aka-ya n'ezie, bú nke o zuru n'ori, ma ọ bu ehi, ma-ọbu inyinya-ibu, ma-ọbu aturu, na ndu; ọ gākwughachi okpukpu abua. 5 Mb͕e onye ọ bula gēme ka anumanu ta nri n'ubi ma-ọbu n'ubi-vine, o we zipu anumanu-ya, o we ta nri n'ubi onye ọzọ; ihe kachasi nma nke ubi-ya, na ihe kachasi nma nke ubi-vine-ya, ka ọ gākwughachi. 6 Mb͕e ọku gāb͕a, we b͕akuru ogwu, ọku ahu we richapu obo ọka, ma-ọbu ọka guzoro eguzo, ma-ọbu ọhia; onye mere ka ọku ahu b͕a aghaghi ikwughachi. 7 Mb͕e onye ọ bula gēnye ibe-ya ego ma-ọbu ihe idebe, ewe zue ya n'ulo nwoke ahu; ọ buru na achọta onye-ori ahu, ọ ghaghi ikwughachi okpukpu abua. 8 Ọ buru na achọtaghi onye-ori ahu, onye-nwe ulo ahu gābiakute Chineke nso, imara ma o setipughi aka-ya n'aru ihe madu-ibe-ya jetara n'ozi. 9 Okwu bayere ihe-njehie ọ bula, ma ọ bu okwu bayere ehi, bayere inyinya-ibu, bayere aturu, bayere uwe-nb͕okwasi, bayere ihe ọ bula furu efu, nke madu nāsi, Nka bu ya, Chineke ka okwu ha abua gābiakute; onye Chineke gāma ikpe, ọ gākwughachi ibe-ya okpukpu abua. 10 Mb͕e onye ọ bula gēnye ibe-ya inyinya-ibu, ma-ọbu ehi, ma-ọbu aturu, ma-ọbu anumanu ọ bula, idebe: o we nwua, ma-ọbu ihe meruru ya aru, ma-ọbu adọta ya n'agha, ma ọ dighi onye nāhu ya: 11 Iyi nke Jehova gādi n'etiti ha abua, imara ma o setipughi aka-ya n'aru ihe ibe-ya jetara n'ozi; onye-nwe anumanu ahu gānara ya, ọ gaghi-akwughachi kwa. 12 Ma o buru na ezuru ya n'ori n'aka-ya n'ezie, ọ gākwughachi onye-nwe-ya. 13 Ọ buru na anu ọhia dọb͕uru ya n'ezie, ya webata ya ka ọ buru ihe-àmà; ọ gaghi-akwughachi ihe anu-ọhia dọb͕uru. 14 Mb͕e onye ọ bula gāriọta anumanu n'aka ibe-ya, ihe we meru ya aru, ma-ọbu ọ nwua, mb͕e onye-nwe-ya nānọghi yere ya, ọ ghaghi ikwughachi. 15 Ọ buru na onye-nwe-ya nọyere ya, ọ gaghi-akwughachi: ọ buru na ọ bu ihe egoro ọlu, ọ biara n'ihi ugwọ-ọlu-ya. 16 Mb͕e nwoke gārafu nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke nke ọ dighi nwoke kwere ilu ya, o we dinayere ya, ọ ghaghi inye ego ọlulu bayere ya ka ọ buru nwunye-ya. 17 Ọ buru na nna-ya ajusi ike iwere ya nye ya, ọ gākwu ego dika ego ọlulu umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke si di. 18 Ekwela ka nwayi-mb͕asi di ndu. 19 Onye ọ bula ya na anumanu nēdina, aghaghi ime ka ọ nwua. 20 Onye nāchuru chi àjà, ma-ọbughi ichuru Jehova, nání Ya, agēwezuga ya ka ebibie ya. 21 Gi emela ọbìa ihe-ike, emeb͕u-kwa-la ya: n'ihi na ndi-ọbìa ka unu buri n'ala Ijipt. 22 Nwayi ọ bula di-ya nwuru, ma-ọbu nwa-nb͕ei, unu ewedala ya n'ala. 23 Ọ buru na i weda ya n'ala ma-ọli, ọ we tikuem n'uzọ ọ bula n'ezie, aghaghm inu ntiku-ya; 24 iwem gādi ọku, M'gēwere kwa mma-agha b͕ue unu; nwunye-unu gāghọ ndinyom di-ha nwuru, umu-unu gāghọ kwa umu-nb͕ei. 25 Ọ buru na i binye onye ọ bula n'etiti ndim ego, bú onye ewedara n'ala, onye gi na ya nọ, aburula ya dika onye nānara ọmuru-nwa; unu atukwasi-kwa-la ya uma. 26 Ọ buru na i were uwe-nb͕okwasi madu-ibe-gi n'ihe-ibe ma-ọli, mb͕e ọdida-anyanwu ruru ka i gēwere ya nyeghachi ya: 27 n'ihi na nke ahu bu ihe-nb͕okwasi o nwere nání ya, nke ahu bu uwe-nb͕okwasi-ya iyikwasi n'akpukpọ-aru-ya: ọ̀ bu nime gini ka o gēdina? o gēru kwa, mb͕e ọ nētikum, na M'gānu; n'ihi na onye-amara ka M'bu. 28 Gi akọchala Chineke, abu-kwa-la onye-isi ndi-gi ọnu. 29 Alala azú inye ùjú-gi na ihe-ọṅuṅu-gi. Nwa-nwoke eburu uzọ mu nime umu-gi ndikom ka i gēnyem. 30 Otú a ka i gēmere ehi-gi, na ìgwè ewu na aturu-gi: ubọchi asa ka ya na nne-ya gānọ: n'ubọchi nke-asatọ i gēwere ya nyem. 31 Ndi di nsọ ka unu gāburum: unu eri-kwa-la anu nke anu-ọhia dọb͕uru n'ọhia; nkita ka unu gātudara ya.

Ọpupu 23

1 Gi eburula akukọ efu: esola onye nēmebi iwu tiye aka-gi ibu onye-àmà nke ihe-ike. 2 Esola ọtutu madu n'azu ba n'ihe ọjọ di iche iche: ab͕a-kwa-la àmà bayere ise-okwu ka i we wezuga onwe-gi iso ọtutu madu n'azu iwezuga ikpé: 3 asọpuru-kwa-la onye nēnweghi ike n'ise-okwu-ya. 4 Mb͕e i zute ehi onye-iro-gi, ma-ọbu inyinya-ibu-ya, ka ọ nākpafu, i ghaghi ime ka ọ laghachikuru ya. 5 Mb͕e i huru inyinya-ibu nke onye nākpọ gi asì ka ibu-ya nānyib͕u ya, ma i nāchọ ighara itọpuru ya ibu ahu, i ghaghi iyere ya aka itọpu ya. 6 Ewezugala ikpé nke ob͕eye-gi n'ise-okwu-ya. 7 I gānọpuru okwu-ugha n'ebe di anya; eb͕u-kwa-la onye ikpé nāmaghi na onye ezi omume: n'ihi na adighm-agu onye nēmebi iwu n'onye ezi omume. 8 Anara-kwa-la ihe-iri-ngo: n'ihi na ihe-iri-ngo nēme ka ndi nāhu uzọ kpu ìsì, ọ nēme kwa ka okwu ndi ezi omume b͕agọ ab͕agọ. 9 Emeb͕u-kwa-la ọbìa: n'ihi na unu onwe-unu amawo nkpuru-obi nke ọbìa, n'ihi na ọbìa ka unu buri n'ala Ijipt. 10 Arọ isi ka i gāgha nkpuru n'ala-gi, chikọta kwa ihe-ọmume-ya: 11 ma n'arọ nke-asa i gārapu ya, me ka ọ tọb͕ọrọ n'efu; ka ndi-ob͕eye nke ndi-gi we rie ihe: anu-ọhia gēri kwa ihe ha rifọrọ. Otú a ka i gēme kwa ubi-vine-gi, me kwa ubi-olive-gi. 12 Ubọchi isi ka i gālu ọlu-gi, ma n'ubọchi nke-asa i gākwusi n'ọlu: ka ehi-gi na inyinya-ibu-gi we zuru ike, ọzọ, ka nwa nke orù-gi nwayi na ọbìa we turu ndu. 13 Ma n'ihe nile M'siworo unu lezienu anya: unu ehota-kwa-la aha chi ọ bula ọzọ, ka aghara kwa inu ya n'ọnu-gi. 14 Ub͕ò atọ ka i gēmerem ememe n'arọ. 15 I gēdebe ememe achicha ekoghi-eko: ubọchi asa ka i gēri achicha ekoghi-eko, dika M'nyere gi iwu, na mb͕e akara àkà n'ọnwa Ebib (n'ihi na ọ bu nime ya ka i siri n'Ijipt puta); ma ọ dighi onye agāhu n'irum ka ọ b͕a aka: 16 i gēdebe kwa ememe nke owuwe-ihe-ubi, bú nke nkpuru mbu nke i lutara n'ọlu, nke i nāgha n'ubi: na ememe nke nchikọta-ihe, n'ọgwugwu arọ, mb͕e i si n'ubi chikọta ihe nile i lutara n'ọlu. 17 Ub͕ò atọ n'arọ ka agāhu ndikom-i nile n'iru Onye-nwe-unu, bú Jehova. 18 Achula ọbara nke àjàm n'elu achicha koro eko; abuba nke ememem agaghi-adigide kwa abali nile rue ututu. 19 Ihe mbu nke nkpuru mbu nile nke ala-ubi-gi ka i gēwebata n'ulo nke Jehova, bú Chineke-gi. Esila nwa-ewu nime miri-ara nke nne-ya. 20 Le, Mu onwem nēziga mọ-ozi n'iru gi, idebe gi n'uzọ, na ime ka i bata n'ebe ahu M'doziworo. 21 Lezie anya n'iru ya, ge kwa nti n'olu-ya; enupula isi n'okpuru ya: n'ihi na ọ gaghi-ab͕aghara njehie-unu; n'ihi na aham di nime ya. 22 N'ihi na, ma ọ buru na i ge nti n'olu-ya n'ezie, we me ihe nile nke M'nēkwu, M'gābu-kwa-ra ndi-iro-gi onye-iro, kpab͕u kwa ndi nākpab͕u gi. 23 N'ihi na mọ-ozim ganēje n'iru gi, me ka i bakute ndi-Amorait, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi Kenean, na ndi-Haivait, na ndi Jebus: M'gēzopu kwa ha n'uwa. 24 Akpọla isi ala nye chi nile ha, efè-kwa-la ha, eme-kwa-la dika omume nile ha si di: kama i gākwadasi ha, tipiasi kwa ogidi nile ha. 25 Ma unu gēfè Jehova, bú Chineke-unu, Ọ gāgọzi kwa nri-gi na miri-gi; M'gēwe-zuga kwa ọria n'etiti gi. 26 Ọ gaghi-adi nwayi nēmebi ime ma-ọbu nwayi-àgà n'ala-gi: M'gēmezu ọnu-ọgugu ubọchi-gi. 27 Oké ujọm ka M'gēziga n'iru gi, chusa ha, bú ndi ahu nile i gābakute ha, M'gēnye kwa gi olu ndi-iro-gi nile. 28 M'gēziga kwa ebu n'iru gi, ha gāchupu ndi-Haivait, na ndi Kenean, na ndi Het, n'iru gi. 29 M'gaghi-achupu ha n'iru gi n'otù arọ; ka ala we ghara ighọ ihe tọb͕ọrọ n'efu, anu-ọhia ewe ba uba megide gi. 30 Nwantī nwantī ka M'gāchupu ha n'iru gi, rue mb͕e i gāmu ọmùmù, we keta ala ahu. 31 M'gētiye kwa ókè-ala-gi site n'Oké Osimiri Uhie we rue oké osimiri ndi Filistia, site kwa n'ọzara rue Osimiri Yufretis: n'ihi na M'gēwere ndi bi n'ala ahu nye n'aka-unu; i gāchupu kwa ha n'iru gi. 32 Gi na ha ab͕ala ndu, gi na chi-ha ab͕a-kwa-la ndu. 33 Ha agaghi-ebi n'ala-gi, ka ha we ghara ime ka i mehie megidem: n'ihi na ọ buru na i fè chi-ha, ọ ghaghi iburu gi ọnyà.

Ọpupu 24

1 Moses ka Ọ siri, Rigokute Jehova, gi onwe-gi, na Eron, na Nedab, na Abaihu, na ọgu madu atọ na iri sitere na ndi-okenye ndi Israel; unu gākpọ kwa isi ala n'ebe di anya: 2 ma nání Moses onwe-ya gābiakute Jehova nso; ma ha onwe-ha agaghi-abiaru nso; ndim agaghi-eso kwa ya rigota. 3 Moses we bia, kọrọ ndi Israel okwu Jehova nile, na ikpé-Ya nile; ndi Israel nile we za n'otù olu, si, Okwu nile Jehova kwuworo, ayi gēme ha. 4 Moses we de okwu Jehova nile n'akwukwọ, o bilie n'isi-ututu, wu ebe-ichu-àjà n'okpuru ugwu ahu, ya na ogidi iri na abua, dika ebo iri na abua nke Israel si di. 5 O zie umu-okorọbia nke umu Israel, ha we sure àjà-nsure-ọku, chiri kwa oke-ehi chuara Jehova àjà, bú àjà-udo. 6 Moses we were nkera ọbara-ha, tiye n'ọkwa di iche iche; nkera ọbara-ha ka ọ wusara n'ebe-ichu-àjà. 7 Ọ were akwukwọ ọb͕ub͕a-ndu ahu, gua ya na nti ndi Israel: ha we si, Ihe nile Jehova kwuworo, ayi gēme ya, nu kwa. 8 Moses we were ọbara ahu, wusa ya n'aru ndi Israel, si, Le, ọbara nke ọb͕ub͕a-ndu ahu, nke Jehova b͕aworo n'ebe unu nọ bayere okwu ndia nile. 9 Moses we rigo, ya na Eron na Nedab na Abaihu, na ọgu madu atọ na iri sitere na ndi-okenye nke Israel: 10 ha we hu Chineke nke Israel; ma n'okpuru ukwu-Ya abua ọ di ka pavement eji nkume sapphire me, ọ di kwa ka elu-igwe onwe-ya n'idi-ọcha. 11 Ma Ọ setipughi aka-Ya megide ndi ahu arọputara n'etiti umu Israel: ha we hu Chineke anya, rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu. 12 Jehova we si Moses, Rigokutem rue ugwu a, nọ kwa n'ebe ahu: ka M'nye kwa gi nkume abua ahu di mbadamba, na iwum, na ihe M'nyere n'iwu, bú nke M'deworo, ka i we zí ha. 13 Moses we bilie, ya na Joshua onye nējere ya ozi: Moses we rigo n'ugwu nke Chineke. 14 Ma ndi-okenye Israel ka ọ siri, Nọdunu n'ebe a nēche ayi, rue mb͕e ayi gālaghachikute unu: ma, le, Eron na Hua nọ n'etiti unu: onye nwere okwu, ya biakute ha nso. 15 Moses we rigo n'ugwu ahu, igwe-oji ahu we kpuchie ugwu. 16 Ebube Jehova biri n'elu ugwu Sainai, igwe-oji ahu nēkpuchi kwa ya ubọchi isi: O si n'etiti igwe-oji ahu kpọ Moses òkù n'ubọchi nke-asa. 17 Ma nile ebube Jehova anya, ọ di ka ọku nērichapu n'elu ugwu ahu n'anya umu Israel. 18 Moses we ba n'etiti igwe-oji ahu, rigorue ugwu ahu: Moses we nọ n'ugwu ahu ọgu ubọchi abua ehihie na abali.

Ọpupu 25

1 Jehova we gwa Moses okwu, si, 2 Gwa umu Israel ka ha wetara m àjà-nbuli: n'aka nwoke ọ bula nke obi-ya nēme ya ka ọ nwe afọ-ofufo ka unu gānara àjà-nbulim. 3 Nka bu kwa àjà-nbuli ahu nke unu gānara n'aka ha; ọla-edo, na ọla-ọcha, na ọla; 4 na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha, na aji ewu; 5 na akpukpọ ebulu esijiri ọbara-ọbara, na akpukpọ seal, na osisi acacia; 6 na manu itiye n'ihe nēnye ìhè, na uda di iche iche itiye na manu nke otite-manu ahu, na ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ me; 7 na nkume onyx, na nkume di iche iche ihiọgide n'ihe, ihiọgide n'ephod na ihiọgide n'ihe-ib͕ochi-obi. 8 Ka ha me-kwa-ram ebe nsọ; ka M'we biri n'etiti ha. 9 Dika ihe nile Mu onwem nēme ka i hu, bú ihe-atù nke ebe-obibim, na ihe-atù nke ihe-ya nile, ọbuná otú a ka unu gēme ya. 10 Ha gēme kwa ib͕e osisi acacia: cubit abua na nkera ka ogologo-ya gādi, otù cubit na nkera ka obosara-ya gādi, otù cubit na nkera ka idi-elu-ya gādi. 11 I gāmachita kwa ya ọla-edo anāgwaghi agwa, nime na azu ka i gāmachita ya, i gēme kwa mpempe ọla-edo n'elu-ya buruburu. 12 I gāwu-kwa-ra ya nb͕a-aka ọla-edo anọ, tiye ha n'ukwu anọ ya; bú nb͕a-aka abua n'otù akuku-ya, na nb͕a-aka abua n'akuku-ya ọzọ. 13 I gēme kwa nkpa-n'aka osisi acacia, machita ha ọla-edo. 14 I gēme kwa ka nkpa-n'aka ahu ba na nb͕a-aka ahu n'elu akuku ib͕e ahu, iwere ha nēbu ib͕e ahu. 15 Nime nb͕a-aka nke ib͕e ahu ka nkpa-n'aka ahu ganādi: agaghi-ewepu ha nime ya. 16 I gētiye kwa n'ib͕e ahu ihe-àmà M'gēnye gi. 17 I gēme kwa ebe-nkpuchi-nmehie nke ọla-edo anāgwaghi agwa: cubit abua na nkera ka ogologo-ya gādi, otù cubit na nkera ka obosara-ya gādi. 18 I gēme kwa cherubim ọla-edo abua; ihe akpuru akpu ka i gēme ha, na nsọtu abua nke ebe-nkpuchi-nmehie. 19 Gi me otù cherub n'otù nsọtu, na otù cherub na nsọtu nke-ọzọ: site n'ebe-nkpuchi-nmehie ka unu gēme cherubim ahu n'elu nsọtu-ya abua. 20 Cherubim ahu ganāb͕asa kwa nkù-ha n'elu, nēkpuchi ebe-nkpuchi-nmehie na nkù-ha, iru-ha nēcherita kwa onwe-ha; n'ebe ebe-nkpuchi-nmehie di ka iru cherubim ahu gādi. 21 I gātukwasi kwa ebe-nkpuchi-nmehie ahu n'ib͕e ahu, n'elu ya; nime ib͕e ahu ka i gētiye ihe-àmà nke M'gēnye gi. 22 M'gēzute kwa gi n'ebe ahu, kpayere gi uka site n'elu ebe-nkpuchi-nmehie, site n'etiti cherubim abua nke di n'elu ib͕e ihe-àmà ahu, bayere ihe nile nke M'gēnye gi n'iwu n'ebe umu Israel nọ. 23 I gēme kwa table osisi acacia: cubit abua ka ogologo-ya gādi, otù cubit ka obosara-ya gādi, otù cubit na nkera ka idi-elu-ya gādi. 24 I gāmachita kwa ya ọla-edo anāgwaghi agwa, me-kwa-ra ya mpempe ọla-edo buruburu. 25 I gēme-kwa-ra ya ihe-njikọ buruburu nke ra ka otù ọbu-aka, i gēme-kwa-ra ihe-njikọ-ya mpempe ọla-edo buruburu. 26 I gēme-kwa-ra ya nb͕a-aka ọla-edo anọ, tiye nb͕a-aka ahu na nkuku ano nke di n'ukwu anọ ya. 27 Na nso ihe-njikọ ahu ka nb͕a-aka gādi, ka ha buru ọnọdu itiye nkpa-n'aka eji ebu table ahu. 28 I gēji kwa osisi acacia me nkpa-n'aka ahu, i gāmachita kwa ha ọla-edo, agēji ha ebu table. 29 I gēme kwa afere-ya nile, na ngaji-ya nile, na iko-ya nile, na ọkwa-ya nile, nke eji awusi àjà-ihe-ọṅuṅu: ọla-edo anāgwaghi agwa ka i gēwere me ha. 30 I gādọba kwa achicha nke iru Chineke n'elu table ahu n'irum mb͕e dum. 31 I gēme kwa ihe-idọba-oriọna nke ọla-edo anāgwaghi agwa: ihe akpuru akpu ka agēme ihe-idọba-oriọna ahu, bú ukwu-ala-ya, na alaka-ya; iko-ya nile, bú isi-ya nile, na okoko-ya nile, gēsite na ya: 32 alaka isi ganēsi n'akuku-ya abua waputa; alaka atọ nke ihe-idọba-oriọna ahu n'otù akuku-ya, alaka atọ nke ihe-idọba-oriọna ahu kwa n'akuku-ya nke-ọzọ: 33 iko atọ emere dika ifuru osisi almond gādi n'otù alaka, otù isi na otù okoko; iko atọ emere dika ifuru osisi almond gādi kwa n'alaka-ibe-ya, otù isi na otù okoko: otú a ka ọ gādiri alaka isi ahu nke nēsi n'ihe-idọba-oriọna ahu waputa: 34 iko anọ emere dika ifuru osisi almond gādi kwa n'ihe-idọba-oriọna ahu, isi-ha na okoko-ha: 35 otù isi gādi kwa n'okpuru alaka abua site na ya, otù isi gādi kwa n'okpuru alaka abua site na ya, otù isi gādi kwa n'okpuru alaka abua site na ya, diri alaka isi ahu nke nēsi n'ihe-idọba-oriọna waputa. 36 Isi-ha alaka-ha gēsite na ya; ihe-idọba-oriọna ahu nile gābu otù ihe eji ọla-edo nke anāgwaghi agwa kpu. 37 I gēme kwa oriọna-ya, ha gādi asa: ha gēweli kwa oriọna-ya nile, ka ọ we nye ìhè na ncherita-iru ya. 38 Nkpa-ya nile na ihe-ikpakepu-ọku-ya nile gābu ọla-edo anāgwaghi agwa. 39 Otù talent nke ọla-edo anāgwaghi agwa ka agēji ma ya, ya na ihe ndia nile. 40 Ma le anya ka i me ha dika ihe-atù-ha si di, nke anēme ka gi onwe-gi hu n'ugwu a.

Ọpupu 26

1 Ebe-obibim ka i gēme kwa: were ákwà-nkwuba iri me ya; ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, nke emere ka ha yie cherubim, bú ọlu onye-ọ̀kà, ihe ndia ka i gēji me ha. 2 Ogologo nke otù ákwà-nkwuba gādi orú cubit na asatọ, obosara nke otù ákwà-nkwuba gādi kwa cubit anọ: otù ọtùtù ka ákwà-nkwuba nile gēnwe. 3 Ákwà-nkwuba ise ganējikọta onwe-ha, otù na ibe-ya; ákwà-nkwuba ise nke-ọzọ ganējikọta onwe-ha, otù na ibe-ya. 4 I gēji kwa ogho anunu me anya-nko n'elu ọnu-ọnu nke otù ákwà-nkwuba, site na nsọtu-ya nime njikọta ahu; otú a ka i gēme kwa n'ọnu-ọnu ákwà-nkwuba nke dipuru adipu nime njikọta nke-abua. 5 Ọgu anya-nko abua na iri ka i gēme n'otù ákwà-nkwuba, ọgu anya-nko abua na iri ka i gēme kwa nime nsọtu nke ákwà-nkwuba nke di na njikọta nke-abua; anya-nko gēcherita onwe-ha iru, otù na ibe-ya. 6 I gēme kwa ọgu nko ọla-edo abua na iri, were nko ahu jikọta ákwà-nkwuba, otù na ibe-ya: ebe-obibi ahu ewe buru otù. 7 I gēme kwa ákwà-nkwuba aji ewu, ibu ulo-ikwū n'elu ebe-obibi ahu: ákwà-nkwuba iri na otù ka i gēme ha. 8 Ogologo nke otù ákwà-nkwuba gādi orú cubit na iri, obosara nke otù ákwà-nkwuba gādi kwa cubit anọ: otù ọtùtù ka ákwà-nkwuba iri na otù ahu gēnwe. 9 I gējikọta kwa ákwà-nkwuba ise iche, na ákwà-nkwuba isi iche, piaji ákwà-nkwuba nke-isi n'ebe iru ulo-ikwū di. 10 I gēme kwa ọgu anya-nko abua na iri n'elu ọnu-ọnu nke otù ákwà-nkwuba ahu dipuru adipu nime njikọta ahu, me kwa ọgu anya-nko abua na iri n'elu ọnu-ọnu nke ákwà-nkwuba nke dipuru adipu nime njikọta nke abua. 11 I gēme kwa ọgu nko ọla abua na iri, me ka nko ahu ba n'anya-nko ahu, i we jikọta ulo-ikwū ahu, ọ we buru otù. 12 Ma nkwupu nke fọduru nime ákwà-nkwuba nke ulo-ikwū ahu, bú nkera ákwà-nkwuba nke fọduru, gākwupu n'azu ebe-obibi ahu. 13 Cubit ahu nke di n'otù akuku, na cubit ahu nke di n'akuku nke-ọzọ, nime nke fọduru n'ogologo nke ákwà-nkwuba nke ulo-ikwū, ọ gākwupu n'akuku abua nke ebe-obibi ahu, n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ, ikpuchi ya. 14 I gēme-kwa-ra ulo-ikwū ahu ihe-nkpuchi akpukpọ ebulu esijiri ọbara-ọbara, ya na ihe-nkpuchi akpukpọ seal n'elu ya. 15 I gēme-kwa-ra ebe-obibi ahu ibo osisi acacia, nke nēguzo ọtọ. 16 Cubit iri ka ogologo nke otù ibo gādi, otù cubit na nkera cubit ka obosara nke otù ibo gādi kwa. 17 Otù ibo gēnwe ihe-nhiọye abua, nke ekwukọtara, otù na ibe-ya: otú a ka i gēmere ibo nile nke ebe-obibi ahu. 18 I gēme-kwa-ra ebe-obibi ahu ibo ahu, orú ibo i gēmere akuku Ndida chere iru na Ndida. 19 Ọgu ukwu ọla-ọcha abua ka i gēme kwa n'okpuru orú ibo ahu; ukwu abua n'okpuru otù ibo inara ihe-nhiọye-ya abua, ukwu abua kwa n'okpuru ibo ọzọ inara ihe-nhiọye-ya abua. 20 I gēme-kwa-ra akuku nke-abua nke ebe-obibi ahu, bú akuku Ugwu, orú ibo: 21 na ọgu ukwu ọla-ọcha ha abua; ukwu abua n'okpuru otù ibo, ukwu abua kwa n'okpuru ibo ọzọ. 22 Isi ebe-obibi ahu nke chere iru n'Ọdida-anyanwu ka i gēme-kwa-ra ibo isi. 23 Ibo abua ka i gēme-kwa-ra nkuku ebe-obibi ahu n'isi-ya. 24 Ha gābu ihe abua ejikọtara n'otù n'okpuru, ha abua gābu kwa otù ihe zuru okè rue isi-ya rue otù nb͕a-aka ahu: otú a ka ọ gādiri ha abua; nkuku abua ahu ka ha gādiri. 25 Ha gādi kwa ibo asatọ, na ukwu ọla-ọcha ha, ukwu iri na isi; ukwu abua n'okpuru otù ibo, ukwu abua kwa n'okpuru ibo ọzọ. 26 I gēme kwa nkpọrọ osisi acacia; ise ka i gēmere ibo otù akuku nke ebe-obibi ahu, 27 nkpọrọ ise ka i gēme-kwa-ra ibo akuku nke-ọzọ nke ebe-obibi ahu, nkpọrọ ise ka i gēme-kwa-ra ibo akuku nke ebe-obibi, bú isi-ya chere iru n'Ọdida-anyanwu. 28 Nkpọrọ etiti nke di n'etiti ibo, anēme kwa ya ka o si n'otù nsọtu gabiga rue nsọtu ọzọ. 29 I gāmachita kwa ibo nile ọla-edo, were kwa ọla-edo me nb͕a-aka-ha, ka ha buru ọnọdu itiye nkpọrọ ahu: i gāmachita kwa nkpọrọ nile ọla-edo. 30 I gēwuli kwa ebe-obibi ahu elu dika ọdidi-ya ekpere n'ikpe si di nke emeworo ka i hu ya anya n'ugwu a. 31 I gēme kwa ákwà-nb͕ochi nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma: ọ gābu ọlu onye-ọ̀kà, ọ gēme ya ka o yie cheru-bim: 32 i gētiye ya n'elu ide acacia anọ amachitara ọla-edo, nkpọye-ha gābu ọla-edo, n'elu ukwu ọla-ọcha anọ. 33 I gētiye kwa ákwà-nb͕ochi ahu n'okpuru nko ahu, i gēbubata kwa n'ebe ahu nime ákwà-nb͕ochi ahu ib͕e ihe-àmà ahu: ákwà-nb͕ochi ahu gākpa-kwa-ra unu ókè n'etiti ebe nsọ ahu na ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile. 34 I gētiye kwa ebe-nkpuchi-nmehie ahu n'elu ib͕e ihe-àmà nime ebe nsọ ahu kachasi ebe nsọ nile. 35 I gādọba table ahu n'èzí ákwà-nb͕ochi ahu, na ihe-idọba-oriọna ahu na ncherita-iru table n'akuku ebe-obibi ahu chere iru na Ndida: ma table ka i gētiye n'akuku Ugwu. 36 I gēme-kwa-ra ọnu-uzọ Ulo-ikwū ahu ákwá-nkwuchi, nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma; ọ gābu ọlu onye-ọdudu-ákwà. 37 I gēme-kwa-ra ákwà-nkwuchi ahu ide acacia ise, machita ha ọla-edo; nkpọye-ha gābu ọla-edo: i gāwu-kwa-ra ha ukwu ọla ise.

Ọpupu 27

1 I gēme kwa ebe-ichu-àjàm ahu; ọ gābu osisi acacia, cubit ise bu ogologo-ya, cubit ise bu kwa obosara-ya; ebe-ichu-àjà ahu gēnwe akuku anọ ra nrata: cubit atọ ka idi-elu-ya gādi kwa. 2 I gēme kwa mpì-ya n'elu nkuku anọ ya: mpì-ya gēsite na ya: i gāmachita kwa ya ọla. 3 I gēme kwa ite-ya nile inara ntu-ya, na osekè-ya nile, na ọkwa-nwusa-ya nile, na ndudu-ya nile, na ihe-igu-ọku-ya nile: ọbuná ihe-ya nile ka i geji ọla me. 4 I gēme-kwa-ra ya ihe-ọkpukpa, ihe eji ub͕u ọla me; i gēme kwa nb͕a-aka ọla anọ n'elu ub͕u ọla ahu, n'elu nsọtu-ya anọ. 5 I gētiye ya n'okpuru ebe dipuru adipu buruburu ebe-ichu-àjà ahu n'okpuru, ka ub͕u ọla ahu we rue na nkera ebe-ichu-àjà ahu. 6 I gēme-kwa-ra ebe-ichu-àjà ahu nkpa-n'aka, bú nkpa-n'aka osisi acacia, machita ha ọla. 7 Agēme ka nkpa-n'aka ahu ba na nb͕a-aka ahu, nkpa-n'aka ahu gādi kwa n'elu akuku abua nke ebe-ichu-aja, mb͕e anēbu ya. 8 I gēwere ibo me ya ka ọ di ka ib͕e: dika emeworo ka i hu ya anya n'ugwu a, otú a ka ha gēme ya. 9 I gēme kwa ogige ebe-obibi ahu: akuku Ndida nke chere iru na Ndida gēnwe ákwà-ngechi igechi ogige ahu nke ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, ọgu cubit ise n'ogologo gādiri otù akuku ahu: 10 ide-ya gādi orú, ukwu-ha kwa orú, ha gābu ọla; nkpọye nile nke ide ahu na ngegide nile ha gābu ọla-ọcha. 11 Otú a akuku Ugwu gēnwe kwa n'ogologo-ya ákwà-ngechi ọgu cubit ise n'ogologo, ide-ya gādi orú, ukwu-ha kwa orú, ha gābu ọla; nkpọye nile nke ide ahu na ngegide nile ha gābu ọla-ọcha. 12 Obo-sara ogige ahu n'akuku Ọdida-anyanwu gēnwe kwa ákwà-ngechi nke ọgu cubit abua na iri: ide-ha gādi iri, ukwu-ha iri kwa. 13 Obosara ogige ahu n'akuku Iru-anyanwu nke chere iru n'ọwuwa-anyanwu gādi ọgu cubit abua na iri. 14 Ákwà-ngechi cubit iri na ise ka otù akuku ọnu-uzọ-ama-ya gēnwe: ide-ha gādi atọ, ukwu-ha atọ kwa. 15 Akuku nke-ọzọ nke ọnu-uzọ-ama-ya gēnwe kwa ákwà-ngechi cubit iri na ise: ide-ha gādi atọ, ukwu-ha atọ kwa. 16 Ọnu-uzọ-ama nke ogige ahu gēnwe kwa ákwà-nkwuchi orú cubit, nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, bú ọlu onye-ọdudu-ákwà: ide-ha gādi anọ, ukwu-ha anọ kwa. 17 Ide nile nke ogige ahu buruburu gabu ihe egegidere ngegide n'ọla-ọcha; nkpọye-ha gābu ọla-ọcha; ma ukwu-ha gābu ọla. 18 Ogologo nke ogige ahu gābu ọgu cubit ise, obosara-ya gābu ọgu abua na iri ọgu abua na iri, idi-elu-ya gābu cubit ise; ọ gābu ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, ma ukwu-ha gābu ọla. 19 Ihe nile nke ebe-obibi ahu n'òfùfè-ya nile, na ǹtú-ya nile, na ǹtú nile nke ogige ahu, gābu ọla. 20 Ma gi onwe-gi, i gēnye umu Israel iwu, ka ha wetara gi manu olive anāgwaghi agwa nke asuru asu, itiye n'ihe nēnye ìhè, iweli oriọna mb͕e dum. 21 N'ulo-ikwū nzute, bú n'èzí ákwà-nb͕ochi nke di n'akuku ihe-àmà, ka Eron na umu-ya ndikom gēdo ya n'usoro site n'anyasi rue ututu n'iru Jehova: ọ gābu ukpuru mb͕e ebighi-ebi rue ọb͕ọ-ha nile site n'umu Israel.

Ọpupu 28

1 Ma gi onwe-gi, me ka Eron, bú nwa-nne-gi, ya na umu-ya ndikom, si n'etiti umu Israel biakute gi nso, ka ọ we burum onye-nchu-aja, bú Eron, ya na Nedab na Abaihu, na Eleeza na Itama, bú umu-ndikom Eron. 2 I gēme-kwa-ra Eron, bú nwa-nne-gi, uwe nsọ, ibu ihe-nsọpuru na ihe mara nma. 3 Gi onwe-gi gāgwa kwa ndi nile nwere obi amam-ihe, bú ndi M'mejuworo na mọ amam-ihe, ka ha me uwe Eron ido ya nsọ, ka o we burum onye-nchu-aja. 4 Ndia bu uwe ha gēme; ihe-ib͕ochi-obi, na ephod, na uwe-nwuda, na uwe-ime turu agwa, na nkechi isi, na ihe ike n'úkwù: ha gēme-kwa-ra Eron, bú nwa-nne-gi, na umu-ya ndikom, uwe nsọ, ka ọ we burum onye-nchu-àjà. 5 Ndi ahu gēwere kwa ọla-edo ahu, na ogho anunu ahu, na ogho ododo ahu, na ogho uhie ahu, na ezi ákwà ọcha ahu. 6 Ha gēme kwa ephod ahu; ọ gābu ọla-edo, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, bú ọlu onye-ọ̀kà. 7 Ọ gēnwe kwa ubu abua ejikọtara na nsọtu-ya abua; ka ewe jikọta ya n'otù. 8 Ihe-ọkiké nke onye-ọ̀kà kpara, nke di n'elu ya, nke eji ke ya, ọ gādi ka ọlu aluru ya si di, o gēsite kwa na ya; ọ gābu ọla-edo, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma. 9 I gēwere kwa nkume onyx abua, b͕unye aha umu Israel n'elu ha: 10 itinye aha ha n'elu otù nkume, aha nke umu Israel isī nke fọduru n'elu nkume nke-ọzọ, dika ọmumu nile ha si di. 11 Ọlu nke onye-ọ̀kà na nkume ka a gēji b͕u eb͕ub͕u nkume abua ahu, dika eb͕ub͕u nb͕a-aka-akàrà, dika aha umu Israel si di: i gēme ka ihe ọla-edo akpara akpà b͕a ha buruburu. 12 I gētiye kwa nkume abua ahu n'elu ubu ephod, iburu umu Israel nkume ncheta: Eron gēbu kwa aha-ha n'iru Jehova n'elu ubu-ya abua, ibu ihe-ncheta. 13 I gēme kwa ihe ọla-edo akpara akpà: 14 na iyab͕a abua nke ọla-edo anāgwaghi agwa; dika eriri-nma ka i gēme ha, ihe emere dika udọ̀ aturu atu; i gētiye kwa iyab͕a ahu aturu atu dika udọ̀ n'elu ihe ọla-edo ahu akpara akpà. 15 I gēme kwa ihe-ib͕ochi-obi nke ikpé, ọ gābu ọlu nke onye-ọ̀kà; dika ọlu aluru n'ephod ahu ka i gēme ya; ọla-edo, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, ndia ka i gēji me ya. 16 Ihe nwere akuku anọ ra nrata ka ọ gābu, ihe apiajiri apiaji, ntù-aka ka ogologo-ya gādi, ntù-aka ka obosara-ya gādi kwa. 17 I gāhiọgide kwa nime ya nhiọgide nkume, eriri nkume anọ: eriri sardius na topaz na carbuncle gābu eriri mbu; 18 eriri nke-abua gābu emerald na sapphire na diamond; 19 eriri nke-atọ gābu jacinth na agate na amethyst: 20 eriri nke-anọ gābu beryl na onyx na jasper: agētiye ha n'ọla-edo akpara akpà n'ebe-nhiọgide-ha. 21 Nkume ahu gādi ka aha umu Israel si di, iri na abua, dika aha-ha si di; dika eb͕ub͕u nb͕a-aka-akàrà, onye ọ bula dika aha-ya si di, ha gādiri ebo iri na abua ahu. 22 I gēme kwa n'elu ihe-ib͕ochi-obi ahu iyab͕a emere dika eriri-nma, bú ihe emere dika udọ̀ aturu atu; ha gābu ọla-edo anāgwaghi agwa. 23 I gēme kwa n'elu ihe-ib͕ochi-obi ahu nb͕a-aka ọla-edo abua, tiye nb͕a-aka abua ahu n'elu nsọtu abua nke ihe-ib͕ochi-obi. 24 I gētiye kwa iyab͕a ọla-edo abua ahu aturu atu dika udọ̀ n'elu nb͕a-aka abua ahu di na nsọtu abua nke ihe-ib͕ochi-obi ahu. 25 Nsọtu abua ọzọ nke iyab͕a abua ahu aturu atu dika udọ̀, i gētiye ha n'elu ihe ọla-edo abua ahu akpara akpà, tiye ha n'elu ubu ephod ahu n'ebe iru-ya di. 26 I gēme kwa nb͕a-aka ọla-edo abua, tukwasi ha n'elu nsọtu abua nke ihe-ib͕ochi-obi ahu, n'ọnu-ọnu-ya, nke chere iru n'akuku ephod ahu nime. 27 I gēme kwa nb͕a-aka ọla-edo abua, tiye ha n'elu ubu abua nke ephod n'okpuru, n'ebe iru-ya di, na nso njikọta-ya, n'elu ihe-ọkiké ephod nke onye-ọ̀kà kpara. 28 Ha gēwere kwa eriri-nma ogho anunu ke ihe-ib͕ochi-obi ahu na nb͕a-aka ephod site na nb͕a-aka-ya, ka ọ we di n'elu ihe-ọkiké ephod ahu nke onye-ọ̀kà kpara, ya na ka ewe ghara isi n'ephod tọpu ihe-ib͕ochi-obi ahu. 29 Eron gēbu kwa aha umu Israel n'ihe-ib͕ochi-obi nke ikpé n'elu obi-ya, mb͕e ọ nābà n'ebe nsọ ahu, ibu ihe-ncheta n'iru Jehova mb͕e dum. 30 I gētiye kwa n'ihe-ib͕ochi-obi nke ikpé ahu Ìhè ahu na Izu-okè ahu; ha gādi kwa n'elu obi Eron mb͕e ọ nābà nime n'iru Jehova: Eron gēbu kwa ikpé nke umu Israel n'elu obi-ya n'iru Jehova mb͕e dum. 31 I gēme kwa uwe-nwuda ephod, ọ gābusi ogho anunu ogho anunu. 32 Ọnu nke isi-ya gādi n'etiti ya: ọnu-ọnu, bú ọlu ọkpa-ákwà, ka ọnu-ya gēnwe buru-buru, dika ọnu nke uwe-obi agha ka ọ gēnwe, ka ewe ghara idọwa ya. 33 I gēme kwa n'ọnu-ọnu-ala-ya pomegranate nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, n'ọnu-ọnu-ala-ya buru-buru; i gēme kwa ataṅu ọla-edo n'etiti ha buruburu. 34 Otù ataṅu ọla-edo na otù pomegranate, otù ataṅu ọla-edo na otù pomegranate, gādi n'ọnu-ọnu-ala uwe-nwuda ahu buruburu. 35 Ọ gādi kwa n'aru Eron iji je ozi: aganānu kwa olu-ya mb͕e ọ nābà n'ebe nsọ n'iru Jehova, ya na mb͕e ọ nāputa, ka ọ we ghara inwu. 36 I gēme kwa ihe di mbara nke ọla-edo anāgwaghi agwa, i gēb͕u kwa n'elu ya, dika eb͕ub͕u nb͕a-aka-akàrà, IHE NSỌ JEHOVA NWERE. 37 I gātukwasi ya n'eriri-nma ogho anunu, ọ gādikwasi n'ákwà-nkukù-isi ahu; n'iru ákwà-nkukù-isi ka ọ gādi. 38 Ọ gādi kwa n'egedege-iru Eron, Eron gēbu kwa ajọ omume nke ihe nsọ nile, nke umu Israel gēdo nsọ n'onyinye nsọ ha nile; ọ gādi n'egedege-iru-ya mb͕e dum, ka ha we buru ihe nātọ utọ n'iru Jehova. 39 I gātu-kwa-ra uwe-ime-ya nke ezi ákwà ọcha agwa, i gēme kwa akwa nkechi nke ezi ákwà ọcha, i gēme kwa ihe ike n'úkwù, ọ gābu ọlu nke onye-ọdudu-ákwà. 40 Umu-ndikom Eron ka i geme-kwa-ra uwe-ime, me-kwa-ra ha ihe ike n'úkwù, ihe ike n'isi ka i gēme-kwa-ra ha, ibu ihe-nsọpuru na ihe mara nma. 41 I gēyi-kwasi ha n'aru Eron, bú nwa-nne-gi, na n'aru umu-ya ndikom tiyere ya; i gēte kwa ha manu, meju aka-ha, do ha nsọ, ka ha we burum ndi-nchu-àjà. 42 Gi me-kwa-ra ha uwe-úkwú ákwà ọcha ikpuchi anu-aru ọtọ-ha; site n'úkwù we rue apata-ukwu ka ha gādi: 43 ha gādi n'aru Eron na n'aru umu-ya ndikom, mb͕e ha nābà n'ulo-ikwū nzute, ma-ọbu mb͕e ha nābiaru nso ebe-ichu-àjà ahu ije ozi n'ebe nsọ ahu, ka ha we ghara iburu ajọ omume, we nwua: ukpuru mb͕e ebighi-ebi ka ọ gāburu ya, buru kwa nkpuru-ya gānọchi ya.

Ọpupu 29

1 Nka bu kwa ihe i gēme ha ido ha nsọ, ka ha we burum ndi-nchu-àjà: were otù nwa-oke-ehi na ebulu abua nke zuru okè, 2 na achicha ekoghieko, na ob͕e achicha ufọdu ekoghieko nke agwara manu, na mbadamba-achicha ufọdu ekoghi-eko nke etere manu: utu flour nke ọka wheat ka i gēwere me ha. 3 I gētiye ha n'otù nkata, bute ha nso nime nkata ahu, ha na oke-ehi ahu na ebulu abua ahu. 4 Eron na umu-ya ndikom ka i gēme kwa ka ha biarue nso ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute, i gēwere miri sa ha aru. 5 I gāchiri kwa uwe ahu, yikwasi Eron uwe-ime, na uwe-nwuda ephod, na ephod, na ihe-ib͕ochi-obi, were kwa ihe-ọkiké nke ephod nke onye-ọ̀kà kpara ke ya: 6 i gēkpukwasi kwa akwa nkechi ahu n'isi-ya, tiye okpu nsọ nke onye-nchu-àjà n'elu ákwà-nkukù-isi ahu. 7 I gēwere kwa manu otite-manu ahu wukwasi n'isi-ya, we te ya. 8 Umu-ya ndikom ka i gēme kwa ka ha biarue nso, i gēyikwasi ha uwe-ime. 9 I gēwere kwa ihe ike n'úkwù ke ha, bú Eron na umu-ya ndikom, i gēke kwa ha ihe ike n'isi: ha gēnwe kwa ọlu nchu-àjà site n'ukpuru ebighi-ebi: i gēmeju kwa aka Eron na aka umu-ya ndikom. 10 I gākputa kwa oke-ehi ahu nso n'iru ulo-ikwū nzute: Eron na umu-ya ndikom gēbikwasi aka-ha n'isi oke-ehi ahu. 11 I gēb͕u kwa oke-ehi ahu n'iru Jehova, n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute. 12 I gēwere ufọdu nime ọbara oke-ehi ahu, tiye n'elu mpì nile nke ebe-ichu-àjà na nkpisi-aka-gi: ọ bu kwa ọbara nile ka i gāwusi na ntọ-ala ebe-ichu-àjà. 13 I gēwere kwa abuba nile nke nēkpuchi ihe-ime, na mba-imeju nke di n'imeju, na akọrọ abua, na abuba nke di n'elu ha, sure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà. 14 Ma anu oke-ehi ahu, na akpukpọ-ya, na nsi-ya, i gēsure ya n'ọku n'azu ọmuma-ulo-ikwū-unu: àjà-nmehie ka ọ bu. 15 Otù nime ebulu abua ahu ka i gēwere kwa; Eron na umu-ya ndikom gēbikwasi aka-ha n'isi ebulu ahu. 16 I gēb͕u ebulu ahu, were ọbara-ya, wusa n'ebe-ichu-àjà ahu buruburu. 17 I gābọ kwa ebulu ahu n'ọbubọ-ya, sa ihe-ime-ya na ọlu-ukwu na ọlu-aka-ya, tiye ha n'elu ọbubọ-ya, na n'elu isi-ya. 18 I gēsure kwa ebulu ahu nile ọku ibu ihe nēsì ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà: àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova ka ọ bu: ihe ísì utọ, àjà-ọku anāchuru Jehova, ka ọ bu. 19 I gēwere kwa ebulu nke-ọzọ; Eron na umu-ya ndikom gēbikwasi kwa aka-ha n'isi ebulu ahu. 20 I gēb͕u kwa ebulu ahu, were ufọdu nime ọbara-ya, tiye n'ọnu-ọnu nti aka-nri Eron, na n'ọnu-ọnu nti aka-nri umu-ya ndikom, na n'isi-aka nke aka-nri-ha, na n'isi-ukwu nke ukwu aka-nri ha, wusa kwa ọbara-ya n'ebe-ichu-àjà ahu buruburu. 21 I gēwere kwa ufọdu nime ọbara nke di n'elu ebe-ichu-àjà, na ufọdu nime manu nke otite-manu ahu, fesa n'aru Eron, na n'elu uwe-ya, na n'aru umu-ya ndikom, na n'elu uwe umu-ya ndikom tiyere ya: ọ gādi kwa nsọ, ya onwe-ya, na uwe-ya, na umu-ya ndikom, na uwe umu-ya ndikom tiyere ya. 22 I gēsi kwa n'ebulu ahu were abuba-ya, na akuku ọdudu-ya nwere abuba, na abuba nke nēkpuchi ihe-ime-ya, na mba-imeju nke imeju, na akọrọ-ya abua, na abuba nke di n'elu ha, na utaku-ukwu aka-nri-ya; n'ihi na ebulu nke nmeju-aka ka ọ bu: 23 na otù ob͕e achicha, na otù ob͕e achicha agwara manu, na otù mbadamba-achicha, site na nkata achicha ekoghi-eko ahu nke di n'iru Jehova: 24 i gātukwasi ha nile n'ọbu-aka abua nke Eron, na n'ọbu-aka nke umu-ya ndikom, fé kwa ha ka ha buru àjà-ofufé n'iru Jehova. 25 I gānara kwa ha n'aka-ha, sure ha ọku ibu ihe nēsì ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà n'elu àjà-nsure-ọku ahu, ka ha buru ihe ísì utọ n'iru Jehova: àjà-ọku anāchuru Jehova ka ọ bu. 26 I gēsi kwa n'ebulu nke nmeju-aka nke diri Eron were okpukpu-obi-ya, fé ya ka ọ buru àjà-ofufé n'iru Jehova: ọ gābu kwa òkè i nwere. 27 I gēdo kwa okpukpu-obi nke àjà-ofufé nsọ, ya na utaku-ukwu nke àjà-nbuli, nke anēfé, na nke anēbuli, site n'ebulu nke nmeju-aka ahu, bú site na nke diri Eron, site kwa na nke diri umu-ya ndikom: 28 ọ gābu kwa ihe Eron na umu-ya ndikom gēnwe dika ukpuru mb͕e ebighi-ebi sitere n'aka umu Israel: n'ihi na àjà-nbuli ka ọ bu: àjà-nbuli ka ọ gābu kwa sitere n'aka umu Israel, site n'ihe àjà nile nke àjà-udo-ha, bú àjà-nbuli-ha anēbuliri Jehova. 29 Uwe nsọ Eron nwere gādiri umu-ya ndikom ndi gānọchi ya, ka ewe te ha manu nime ha, meju kwa aka-ha nime ha. 30 Ubọchi asa ka o gēyiri ha, bú onye-nchu-àjà ahu nke gānọchi ya site n'umu-ya ndikom, mb͕e ọ nābà n'ulo-ikwū nzute ije ozi n'ebe nsọ ahu. 31 Ma ebulu nke nmeju-aka ahu, i gēwere ya sie anu-ya n'ebe di nsọ. 32 Eron na umu-ya ndikom gēri kwa anu ebulu ahu, na achicha nke di na nkata ahu, n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute. 33 Ha gēri kwa ha, bú ihe eji kpuchi nmehie, imeju aka-ha na ido ha nsọ: ma onye ala ọzọ agaghi-eri ha, n'ihi na nsọ ka ha di. 34 Ma ọ buru na ihe afọdu site n'anu nke nmeju-aka ahu, ma-ọbu site n'achicha, rue ututu, i gēsure kwa ihe fọduru n'ọku: agaghi-eri ya, n'ihi na nsọ ka ọ di. 35 I gēme kwa Eron, me kwa umu-ya ndikom, otú a, dika ihe nile si di nke M'nyeworo gi n'iwu: ubọchi asa ka i gēmeju aka-ha. 36 Oke-ehi nke àjà-nmehie ka i gāchu kwa bayere nkpuchi-nmehie kwa-ubọchi: i gēwepu kwa nmehie n'ebe-ichu-àjà ahu mb͕e i nēkpuchi nmehie n'elu ya; i gēte kwa ya manu, ido ya nsọ. 37 Ubọchi asa ka i gēkpuchi nmehie n'elu ebe-ichu-àjà ahu, we do ya nsọ: ebe-ichu-àjà ahu gābu kwa ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile: ihe ọ bula nke nēmetu ebe-ichu-àjà ahu aru gādi nsọ. 38 Ma nka bu ihe i gāchu n'elu ebe-ichu-àjà ahu; umu-aturu abua, nke b͕ara otù arọ, kwa-ubọchi mb͕e dum. 39 Otù nime umu-aturu ahu ka i gāchu n'ututu; chu kwa nwa-aturu nke-ọzọ n'etiti ehihie na anyasi: 40 otù uzọ n'uzọ iri nke otù ephad utu oka flour agwara n'otù uzọ n'uzọ anọ nke otù hin nke manu asuru asu gādiri otù nwa-aturu ahu; ya na otù uzọ n'uzọ anọ nke otù hin nke manya-vine, ka ọ buru àjà-ihe-ọṅuṅu. 41 Nwa-aturu nke-ọzọ ka i gāchu kwa n'etiti ehihie na anyasi; dika onyinye-inata-iru-ọma enyere n'ututu, na dika àjà-ihe-ọṅuṅu-ya, otú a ka i gēme ya, ka ọ buru ihe ísì utọ, àjà-ọku anāchuru Jehova. 42 Ọ gābu àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum rue ọb͕ọ-unu nile n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute n'iru Jehova: ebe M'gēzute unu, igwa gi okwu n'ebe ahu. 43 M'gēzute kwa umu Israel n'ebe ahu; anēji kwa ebubem do Ulo-ikwū ahu nsọ. 44 M'gēdo kwa ulo-ikwū nzute nsọ, ya na ebe-ichu-àjà ahu: Eron na umu-ya ndikom ka M'gēdo kwa nsọ, iburum ndi-nchu-àjà. 45 M'gēbi kwa n'etiti umu Israel, M'gābu-kwa-ra ha Chineke. 46 Ha gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova Chineke-ha, Nke mere ka ha si n'ala Ijipt puta, ka M'we biri n'etiti ha: Mu onwem bu Jehova Chineke-ha.

Ọpupu 30

1 I gēme kwa ebe-ichu-àjà isure ihe-nsure-oku nēsì ísì utọ: osisi acacia ka i gēji me ya. 2 Otù cubit ka ogologo-ya gādi, otù cubit ka obosara-ya gādi kwa; ihe nwere akuku anọ ra nrata ka ọ gābu: cubit abua ka idi-elu-ya gādi kwa: mpì-ya nile gēsite na ya. 3 I gāmachita ya ọla-edo anāgwaghi agwa, elu-ya, na akuku-ya nile buruburu, na mpì-ya nile; i gēme-kwa-ra ya mpempe ọla-edo buruburu. 4 Nb͕a-aka ọla-edo abua ka i gēme-kwa-ra ya n'okpuru mpempe-ya, n'elu ihe-akuku-ya abua, i gēme ha n'elu akuku-ya abua; ha gābu kwa ọnọdu inara nkpa-n'aka eji ebu ya. 5 I gēji kwa osisi acacia me nkpa-n'aka ahu, i gāmachita kwa ha ọla-edo. 6 I gētiye ya n'iru ákwà-nb͕ochi nke di n'akuku ib͕e ihe-àmà, n'iru ebe-nkpuchi-nmehie nke di n'elu ihe-àmà ahu, ebe M'gēzute gi. 7 Eron gēsure kwa n'elu ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me: kwa-ututu, mb͕e ọ nēdozi oriọna, ka ọ gēsure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ. 8 Mb͕e Eron nēweli oriọna n'etiti ehihie na anyasi ka ọ gēsure kwa ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ọ bu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ anēsure n'iru Jehova mb͕e dum rue ọb͕ọ-unu nile. 9 Unu ewerela ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ nke ala ọzọ, ma-ọbu àjà-nsure-ọku, ma-ọbu onyinye-inata-iru-ọma, sure dika àjà n'elu ya; unu awusi-kwa-la àjà-ihe-ọṅuṅu n'elu ya. 10 Eron gēkpuchi kwa nmehie n'elu mpì-ya otù ub͕ò n'arọ: site n'ọbara àjà-nmehie nke nkpuchi-nmehie ka o gēkpuchi nmehie n'elu-ya otù ub͕ò n'arọ rue ọb͕ọ-unu nile: ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile ka ọ buru Jehova. 11 Jehova we gwa Moses okwu, si, 12 Mb͕e i nāguta ọnu-ọgugu umu Israel, dika ndi anāgukọta agukọta n'etiti ha si di, ha nile n'otù n'otù gēnye kwa Jehova ihe-nb͕aputa bayere nkpuru-obi-ha, mb͕e i nāgukọta ha; ka ihe-otiti we ghara idi n'etiti ha mb͕e i nāgukọta ha. 13 Ihe a ka ha gēnye, onye ọ bula nke nāgabiga n'ebe ndi agukọtaworo nọ, nkera shekel dika shekel nke ebe nsọ ahu si di: (shekel bu orú gerah: ) nkera shekel ahu bu àjà-nbuli anēbuliri Jehova. 14 Onye ọ bula nke nāgabiga n'ebe ndi agukọtaworo nọ, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, ọ gēnye àjà-nbuli nke Jehova. 15 Ọgaranya agaghi-enye kari, ma ob͕eye agaghi-enyebì kari, nkera shekel ahu, mb͕e ha nēnye àjà-nbuli nke Jehova, ikpuchiri nkpuru-obi-unu nmehie. 16 I gānara kwa ego nkpuchi-nmehie ahu n'aka umu Israel, nye ya n'òfùfè nke ulo-ikwū nzute; ka ọ we buru umu Israel ihe-ncheta n'iru Jehova, ikpuchiri nkpuru-obi-unu nmehie. 17 Jehova we gwa Moses okwu, si, 18 I gēme kwa ite ọsisa-miri, ọ gābu ọla, ukwu-ala-ya gābu kwa ọla, iji sa aru: i gētiye ya n'etiti ulo-ikwū nzute na ebe-ichu-àjà, tiye miri n'ebe ahu. 19 Eron na umu-ya ndikom gāsa aka-ha na ukwu-ha site na ya: 20 mb͕e ha nābà n'ulo-ikwū nzute, ha gāsa miri, ka ha we ghara inwu; ma-ọbu mb͕e ha nābiaru ebe-ichu-àjà nso ije ozi, isurere Jehova àjà-ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ: 21 ha gāsa kwa aka-ha na ukwu-ha, ka ha we ghara inwu: ọ gābu-kwa-ra ha ukpuru mb͕e ebighi-ebi, bú ya na nkpuru-ya rue ọb͕ọ-ha nile. 22 Jehova we gwa Moses okwu, si, 23 Gi onwe-gi kwa, chiri n'onwe-gi uda nile kachasi nma, myrrh nke nērù erù, nnù shekel na ọgu ise, na uda-cinnamon, nkera-ya, bú ọgu shekel iri na ọgu abua na iri, na uda-calamus, ọgu shekel iri na ọgu abua na iri, 24 na cassia, nnù shekel na ọgu ise, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di, na manu olive, otù hin: 25 i gēme ya ka ọ buru manu otite-manu di nsọ, manu-otite nēsì ísì utọ asugwara asugwa, bú ọlu nke onye nāsugwa manu-otite nēsì ísì utọ: manu otite-manu di nsọ ka ọ gābu. 26 I gēwere ya te ulo-ikwū nzute, na ib͕e ihe-àmà ahu, 27 na table ahu na ihe-ya nile, na ihe-idọba-oriọna na ihe-ya nile, na ebe-ichu-àjà nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, 28 na ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku na ihe-ya nile, na ite ọsisa-miri ahu na ukwu-ala-ya. 29 I gēdo kwa ha nsọ, ka ha we buru ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile: ihe ọ bula nēmetu ha aru gādi nsọ. 30 Eron na umu-ya ndikom ka i gēte kwa manu, we do ha nsọ, iburum ndi-nchu-àjà. 31 I gāgwa kwa umu Israel okwu, si, Manu otite-manu di nsọ ka nka gāburum rue ọb͕ọ-unu nile. 32 Ọ bughi n'anu-aru madu ka agāwukwasi ya, unu eme-kwa-la nke di ka ya n'ọtùtù-ya: nsọ ka ọ di, nsọ ka ọ gādiri unu. 33 Onye ọ bula nke gāsugwa nke di ka ya, ma-ọbu onye ọ bula nke gēwere ufọdu nime ya tiye n'aru onye ala ọzọ, agēbipu ya n'etiti umu-nna-ya. 34 Jehova we si Moses, Chiri n'onwe-gi uda utọ di iche iche, stacte, na onycha, na galbanum; bú uda utọ, ha na frankincense anāgwaghi agwa: ha gāra n'ọtùtù; 35 i gēme ya ka ọ buru ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, manu-otite nēsì ísì utọ asugwara asugwa, bú ọlu onye nāsugwa manu-otite nēsì ísì utọ, nke etiyere nnú, nke anāgwaghi agwa, di kwa nsọ: 36 i gēsu kwa ufọdu nime ya ka ọ di irighiri, were ufọdu nime ya tiye n'iru ihe-àmà ahu n'ulo-ikwū nzute, ebe M'gēzute gi; ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ gāburu unu. 37 Ma ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ nke i gēme, unu emerela onwe-unu nke di ka ya n'ọtùtù-ya: nsọ ka ọ gādiri gi n'ebe Jehova nọ. 38 Onye ọ bula nke gēme nke di ka ya, inu ísì-ya, agēbipu kwa ya n'etiti umu-nna-ya.

Ọpupu 31

1 Jehova we gwa Moses okwu, si, 2 Le, akpọwom Bezalel n'aha, bú nwa Uri, nwa Hua, nke ebo Juda: 3 emejuwokwam ya na Mọ nke Chineke, n'amam-ihe, na nime nghọta, na n'ihe-ọmuma, na n'ije-ozi ọ bula, 4 icheputa ọlu onye-ọ̀kà di iche iche, ilu ọlu n'ọla-edo, na n'ọla-ọcha, na n'ọla, 5 na n'ilu ọlu onye-ọ̀kà na idukọta ya adukọta, na n'ilu ọlu onye-ọ̀kà n'osisi, ilu ọlu n'ije-ozi ọ bula. 6 Ma Mu onwem, le, enyewom Ọhọliab tiyere ya, bú nwa Ahisamak, nke ebo Dan; ọ bu kwa n'obi onye ọ bula nke nwere obi amam-ihe ka M'tiyeworo amam-ihe, ka ha we me ihe nile nke M'nyeworo gi n'iwu: 7 ulo-ikwū nzute, na ib͕e nke diri ihe-àmà ahu, na ebe-nkpuchi-nmehie nke di n'elu ya, na ihe nile nke Ulo-ikwū ahu; 8 na table ahu na ihe-ya nile, na ihe-idọba-oriọna nke ọla-edo anāgwaghi agwa na ihe-ya nile, na ebe-ichu-àjà nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, 9 na ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku na ihe-ya nile, na ite ọsisa-miri ahu na ukwu-ala-ya: 10 na uwe nile akpara nke ọma, na uwe nsọ nile Eron, bú onye-nchu-aja, nwere, na uwe nile nke umu-ya ndikom, ibu ndi-nchu-àjà; 11 na manu nke otite-manu, na ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me, bú nke diri ebe nsọ ahu: dika ihe M'nyeworo gi n'iwu si di, otú a ka ha gēme. 12 Jehova we gwa Moses okwu, si, 13 Gi onwe-gi kwa, gwa umu Israel okwu, si, N'ezie ubọchi-izu-ikem nile ka unu gēdebe: n'ihi na ihe-iriba-ama ka ọ bu n'etiti Mu na unu rue ọb͕ọ-unu nile; ka unu we mara na Mu onwem bu Jehova Nke nēdo unu nsọ. 14 Unu gēdebe kwa ubọchi-izu-ikem; n'ihi na nsọ ka ọ diri unu: onye nēme ya ka ọ ghara idi nsọ, aghaghi ime ka ọ nwua: n'ihi na onye ọ bula nke nēje ozi nime ya, agēbipu onye ahu n'etiti umu-nna-ya. 15 Ubọchi isi ka agēje ozi; ma n'ubọchi nke-asa ubọchi-izu-ike nke idebe-ubọchi-izu-ike di, ọ bu ihe nsọ Jehova nwere: onye ọ bula nke nēje ozi n'ubọchi-izu-ike, aghaghi ime ka ọ nwua. 16 Ma umu Israel gēdebe ubọchi-izu-ike, ime ememe ubọchi-izu-ike ahu rue ọb͕ọ-ha nile, ọ bu ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi. 17 Ihe-iriba-ama ka ọ bu n'etiti Mu na umu Israel rue mb͕e ebighi-ebi: n'ihi na n'ubọchi isi ka Jehova mere elu-igwe na uwa, ma ọ bu n'ubọchi nke-asa ka Ọ kwusiri n'ọlu-Ya, wee zuru ike. 18 Mb͕e Ọ kpayesiri Moses uka n'ugwu Sainai, O we nye ya mbadamba nkume abua nke ihe-àmà ahu, bú mbadamba nkume, nke ewere nkpisi-aka Chineke de ihe n'elu ha.

Ọpupu 32

1 Ndi Israel we hu na Moses nọrọ ọdù isi n'ugwu ahu ridata, ndi ahu we kpọkọta onwe-ha n'ebe Eron nọ, si ya, Bilie, mere ayi chi, ndi ganēje n'iru ayi; n'ihi na Moses a, bú nwoke nke mere ka ayi si n'ala Ijipt rigoputa, ayi amaghi ihe meworo ya. 2 Eron we si ha, Tijipunu nb͕a-aka ọla-edo nke di nime nti nke nwunye-unu, na nke umu-unu ndikom, na nke umu-unu ndinyom, chitaram ha. 3 Ndi ahu nile we tijipu nb͕a-aka ọla-edo nke di nime nti-ha, chitara ha Eron. 4 Ọ we nara ya n'aka-ha, were ihe eji eb͕u eb͕ub͕u b͕ue ya, me ya ka ọ ghọ nwa-ehi akpuru akpu: ha we si, Ndia bu chi-gi, Israel, ndi mere ka i si n'ala Ijipt rigoputa. 5 Eron we hu ya, we wue ebe-ichu-àjà n'iru ya; Eron we kpọ òkù, si, Ememe ka agēmere Jehova echi. 6 Ha we bilie n'isi-ututu n'echi-ya, sure àjà-nsure-ọku, chita kwa ihe àjà-udo; ndi ahu we nọdu ala iri ihe na iṅu ihe, ha we bilie igwu egwú. 7 Jehova we gwa Moses okwu, si, Je, rida; n'ihi na ndi-gi, nke i mere ka ha si n'ala Ijipt rigoputa, ebibiwo onwe-ha: 8 ha esiwo n'uzọ nke M'nyere ha n'iwu wezuga onwe-ha ngwa ngwa: ha eme-woro onwe-ha nwa-ehi akpuru akpu, ha we kpọ isi ala nye ya, chu-kwa-ra ya àjà, si, Ndia bu chi-gi, Israel, ndi mere ka i si n'ala Ijipt rigoputa. 9 Jehova si-kwa-ra Moses, Ahuwom ndi nka, ma, le, ndi kwesiri olu ike ka ọ bu: 10 ma ub͕u a kwe ka M'nọduru Onwem, ka iwem we di ọku megide ha, ka M'we me kwa ka ha gwusia; M'gēme kwa gi ka i buru mba uku. 11 Moses we chọ ime ka iwe Jehova, bú Chineke-ya, dajua, ọ si, Jehova, n'ìhi gini ka iwe-Gi di ọku megide ndi-Gi, nke I meworo ka ha si n'ala Ijipt puta n'ike uku na n'aka di ike? 12 N'ìhi gini ka ndi Ijipt ganēkwu, si, Ọ bu ime ha ihe ọjọ ka O mere ka ha pua, ib͕u ha n'ugwu, na ime ka ha si n'elu uwa gwusia? Si n'idi-ọku nke iwe-Gi chigharia, chegharia n'ihe ọjọ a I nēchè imegide ndi-Gi. 13 Cheta Abraham, na Aisak, na Israel, bú ndi-orù-Gi, ndi I ji Onwe-gi ṅuru iyi, I we gwa ha okwu, si, M'gēme ka nkpuru-unu ba uba dika kpakpando nke elu-igwe, ala nka nile kwa nke M'kwuworo okwu bayere ya, M'gēnye nkpuru-gi ya, ha gēketa kwa ya rue mb͕e ebighi-ebi. 14 Jehova we chegharia uche bayere ihe ọjọ nke O kwuru, si na Ọ gēme ndi-Ya. 15 Moses we chigharia, si n'ugwu ahu rida, mbadamba nkume abua nke ihe-àmà ahu di kwa n'aka-ya; bú mbadamba nkume nke edere ihe n'iru ha abua; n'otù iru na n'iru nke-ọzọ ka edeworo ihe n'elu nkume ahu. 16 Mbadamba nkume ahu, ọlu Chineke ka ha bu; odide ahu kwa, odide Chineke ka ọ bu, bú eb͕ub͕u eb͕uru n'elu mbadamba nkume abua ahu. 17 Joshua we nu olu ndi Israel ka ha nēti nkpu, ọ we si Moses, Olu agha di n'ọmuma-ulo-ikwū. 18 Ọ si, Ọ bughi olu ndi nāza n'idi-ike, ọ bughi kwa olu ndi nāza n'adighi-ike; olu ndi nāza n'ibù abù ka mu onwem nānu. 19 O rue, mb͕e ọ biaruru ọmuma-ulo-ikwū ahu nso, na ọ huru nwa-ehi ahú na otite-egwú ahu: iwe Moses we di ọku, o we tupu mbadamba nkume ahu n'aka-ya, tupia ha n'okpuru ugwu ahu. 20 O we were nwa-ehi ahu nke ha mere, sure ya n'ọku, gwe ya rue mb͕e o mere irighiri, o we fesa ya n'elu miri, me ka umu Israel ṅua ya. 21 Moses we si Eron, Gini ka ndi nka mere gi, na i mewo ka nmehie uku biakwasi ha? 22 Eron we si, Ka iwe onye-nwem ghara idi ọku: gi onwe-gi amawo ndi nka, na ọ bu nime ihe ọjọ ka ha nọ. 23 Ha we sim, Mere ayi chi, ndi ganēje n'iru ayi: n'ihi na Moses a, bú nwoke nke mere ka ayi si n'ala Ijipt rigoputa, ayi amaghi ihe meworo ya. 24 M'we si ha, Onye ọ bula nke nwere ọla-edo, ka ha tijipu ya n'aru ha; ha we nyem: m'we tubà ya n'ọku, nwa-ehi a we puta. 25 Moses we hu ndi ahu na ndi nādighi nchikọta ka ha bu; n'ihi na Eron emewo ka ha ghara idi nchikọta, ka ha buru ihe-ntakwu n'etiti ndi nēbili imegide ha: 26 Moses we guzo n'ọnu-uzọ-ama nke ọmuma-ulo-ikwū ahu, si, Ònye diri Jehova? ya biakutem. Umu-ndikom Livai nile we chikọta onwe-ha n'ebe ọ nọ. 27 Ọ si ha, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, Turunu, Nwoke ọ bula n'etiti unu, ya turu mma-agha-ya n'apata-ukwu-ya, gabiganu bia-ghachi kwa site n'otù ọnu-uzọ-ama rue ọnu-uzọ-ama ọzọ n'ọmuma-ulo-ikwū a nile, b͕u-kwa-nu, nwoke ọ bula, ya b͕ue nwa-nne-ya, nwoke ọ bula, ya b͕ue eyì-ya, nwoke ọ bula, ya b͕ue onye-aru-ya. 28 Umu-ndikom Livai we me dika okwu Moses si di: ihe ra ka nnù ndikom asa na ọgu iri we si n'etiti ndi Israel da n'ubọchi ahu. 29 Moses we si, Mejuenu aka-unu ta nye Jehova, n'ihi na nwoke ọ bula nēmegide nwa-ya nwoke, nēmegide kwa nwa-nne-ya nwoke; ka Ọ we nye unu ngọzi ta. 30 O rue, n'echi-ya, na Moses siri ndi Israel, Unu onwe-unu emehiewo nmehie uku: ma ub͕u a m'gārigokuru Jehova; eleghi anya m'gēkpuchi nmehie-unu. 31 Moses we jeghachikuru Jehova, si, Biko, ndi nka emehiewo nmehie uku, mere onwe-ha chi ọla-edo. 32 Ma ub͕u a, ọ buru na I gāb͕aghara nmehie-ha; ma ọ buru na I meghi ya, biko, hichapum n'akwukwọ-Gi nke I deworo. 33 Jehova we si Moses, Onye ọ bula nke mehieworo megidem, ya ka M'gēhi-chapu n'akwukwọm. 34 Ma ub͕u a, je, duru ndim rue ebe ahu nke M'gwaworo gi okwu bayere ya: le, mọ-ozim ganēje n'iru gi: ma n'ubọchi mb͕e M'nēleta, M'gēwere kwa nmehie-ha leta ha. 35 Jehova we tie ndi Israel ihe, n'ihi na ha mere nwa-ehi ahu, nke Eron mere.

Ọpupu 33

1 Jehova we gwa Moses okwu, si, Je, si n'ebe a rigo, gi onwe-gi na ndi ahu nke i mere ka ha si n'ala Ijipt rigoputa, rue ala ahu nke M'ṅuru Abraham iyi, ṅu-kwa-ra Aisak, ṅu-kwa-ra Jekob, si, Nkpuru-gi ka M'gēnye ya: 2 M'gēziga kwa mọ-ozi n'iru gi; M'gāchupu kwa ndi Kenean, na ndi-Amorait, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus: 3 rue ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya: n'ihi na M'gaghi-arigo n'etiti gi; n'ihi na ndi kwesiri olu ike ka i bu: ka M'we ghara ime ka i gwusia n'uzọ. 4 Ndi Israel we nu okwu ọjọ a, ha we rue újú: ọ dighi kwa onye ọ bula tiyere ihe-ichọ-nma-ya n'aru ya. 5 Jehova we si Moses, Si umu Israel, Unu onwe-unu bu ndi kwesiri olu ike: asi na ọ bu otù ntabi-anya ka M'gārigo n'etiti gi, M'gēme kwa ka i gwusia; ma ub͕u a wepu ihe-ichọ-nma-gi nile n'aru gi tọb͕ọ, M'we mara ihe M'gēme gi. 6 Umu Israel we napusi onwe-ha ihe-ichọ-nma-ha nile site n'ugwu Horeb gaba. 7 Ma Moses nēwere ulo-ikwū ahu, nāmara onwe-ya n'azu ọmuma-ulo-ikwū, n'ebe di anya site n'ọmuma-ulo-ikwū ahu; ọ we kpọ ya, Ulo-ikwū nzute. O rue, na onye ọ bula nke nāchọ Jehova nāpu je ulo-ikwū nzute ahu nke di n'azu ọmuma-ulo-ikwū. 8 O rue, mb͕e Moses puru ije Ulo-ikwū ahu, na ndi Israel nile biliri, guzo onwe-ha ọtọ, nwoke ọ bula n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū-ya, nēlegide Moses anya n'azu, rue mb͕e ọ bara n'Ulo-ikwū ahu. 9 O rue, mb͕e Moses batara n'Ulo-ikwū ahu, na ogidi igwe-oji ahu ridatara, guzo n'ọnu-uzọ nke Ulo-ikwū: Jehova we gwa Moses okwu. 10 Ndi Israel nile we hu ogidi igwe-oji ka o nēguzo n'ọnu-uzọ nke Ulo-ikwū ahu: ndi ahu nile we bilie, kpọ isi ala, nwoke ọ bula n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū-ya. 11 Jehova we gwa Moses okwu iru n'iru, dika madu nāgwa eyì-ya okwu. Ọ we laghachi n'ọmuma-ulo-ikwū ahu: ma onye nējere ya ozi, bú Joshua, nwa Nun, bú okorọbia, adighi-esi n'etiti Ulo-ikwū ahu pua. 12 Moses we si Jehova, Le, Gi onwe-gi nāsim, Me ka ndi nka rigota: ma Gi onwe-gi emeghi ka M'mara onye I gēziga ka mu na ya yikọ je. Ma Gi onwe-gi asiwo, Amawom i n'aha, ọzọ kwa, i hutawo amara n'irum. 13 Ma ub͕u a, biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru Gi, biko, mem ka m'mara uzọ-Gi nile, m'gāmara kwa Gi, ka m'we huta amara n'iru Gi: Gi le kwa na ndi-Gi ka mba nka bu. 14 Ọ si, Irum ganēje, M'gēme kwa ka i zuru ike. 15 Ọ si Ya, Ọ buru na iru-Gi adighi-eje, emela ka ayi si n'ebe a rigo. 16 N'ihi na ọ̀ bu n'ihi gini ka agāmara ub͕u a na ahutawom amara n'iru Gi, mu onwem na ndi-Gi? ọ̀ bughi n'ojije I nēsoro ayi je, ewe kewapu ayi, bú mu onwem na ndi-Gi, n'ebe ndi nile nọ ndi bi n'elu uwa. 17 Jehova we si Moses, Ihe a nke i kwuworo, M'gēme kwa ya: n'ihi na i hutawo amara n'irum, amawokwam i n'aha. 18 Ọ si, Biko, me ka m'hu ebube-Gi. 19 Ọ si, Mu onwem gēme ka idi-nmam nile gabiga n'iru gi, M'gākpọ kwa òkù bayere aha Jehova n'iru gi: M'gēme-kwa-ra onye ahu amara, bú onye M'gēmere amara, M'gēnwe kwa obi-ebere n'aru onye ahu nke M'gēnwe obi-ebere n'aru ya. 20 Ọ si kwa, I pughi ihu irum anya: n'ihi na madu agaghi-ahum anya, di kwa ndu. 21 Jehova we si, Le, ọnọdu di n'akukum, i gēguzo kwa onwe-gi ọtọ n'elu oké nkume ahu. 22 O gēru kwa, mb͕e ebubem nāgabiga, na M'gētiye gi nime oghere nke oké nkume ahu, b͕asa ọbu-akam b͕ochita gi, rue mb͕e M'gabiga-woro: 23 M'gēwezuga kwa ọbu-akam, i gāhu kwa azum anya: ma agaghi-ahu irum anya.

Ọpupu 34

1 Jehova we si Moses, Wara onwe-gi mbadamba nkume abua dika nke-mbu: M'gēdekwasi kwa na mbadamba nkume ahu okwu nile nke di n'elu mbadamba nkume mbu, nke i tupiara. 2 Nọ na njikere rue ututu, rigota n'ugwu Sainai n'ututu, guzorom onwe-gi ọtọ n'ebe ahu n'elu ugwu ahu. 3 Ọ dighi kwa onye ọ bula gēsoro gi rigota, ọzọ kwa, ka aghara ihu onye ọ bula n'ugwu ahu nile; ọzọ, ìgwè ewu na aturu ma -ọbu ìgwè ehi atala nri n'akuku ugwu ahu. 4 Ọ we wa mbadamba nkume abua dika nke-mbu; Moses we bilie n'isi-ututu, rigorue ugwu Sainai, dika Jehova nyere ya iwu, o were kwa mbadamba nkume abua n'aka-ya. 5 Jehova we ridata n'igwe-oji, o guzo onwe-ya n'ebe Ọ nọ n'ebe ahu, we kpọkue aha Jehova. 6 Jehova we gabiga n'iru ya, kpọ òkù, si, Jehova, Jehova, Chineke nke nwere obi-ebere, Onye nēme amara, Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ, Onye nāba uba n'ebere na ezi-okwu; 7 Onye nēdebere nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri ọtutu ub͕ò ebere, Onye nāb͕aghara ajọ omume na njehie na nmehie: ma ọ dighi uzọ ọ bula Ọ gāgu ndi ikpe mara na ha bu ndi ikpe nāmaghi; Ọ nēwere ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta kwa umu umu, leta umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ. 8 Moses we me ngwa, rube isi-ya n'ala, kpọ isi ala. 9 Ọ si, Biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru Gi, Onye-nwe-ayi, biko, ka Onye-nwe-ayi nēje n'etiti ayi; n'ihi na ndi kwesiri olu ike ka ayi bu; Gi b͕aghara kwa ajọ omume-ayi na nmehie-ayi, keta kwa ayi n'ihe-nketa. 10 Ọ we si, Le, Mu onwem nāb͕a ndu: n'iru ndi-gi nile ka M'gālu oké ọlu di iche iche, bú nke ọ dighi mb͕e ekere ha n'uwa nile, ma-ọbu nime mba ọ bula: ndi nile ndi gi onwe-gi nọ n'etiti ha gāhu kwa ọlu Jehova, n'ihi na ihe-egwù ka ọ bu, bú nke Mu onwem nēme n'ebe i nọ. 11 Debere onwe-gi ihe nke Mu onwem nēnye gi n'iwu ta: le, M'gaje ichupu ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus, n'iru gi. 12 Lezie onwe-gi anya, ka gi na ndi bi n'ala nke gi onwe-gi nābà nime ya ghara ib͕a ndu, ka ọ we ghara ibu ọnyà n'etiti gi: 13 kama unu gākwatu ebe-ichu-àjà nile ha, tupia ogidi nile ha, b͕utu Asherim-ha: 14 n'ihi na i gaghi-akpọ isi ala nye chi ọzọ: n'ihi na Jehova, Nke Onye-ekworo bu aha-Ya, Chineke ekworo ka Ọ bu: 15 ka gi na ndi bi n'ala ahu we ghara ib͕a ndu, ha we so chi-ha nākwa iko, churu chi-ha àjà, otù onye ewe kpọ gi, i we rie ufọdu nime ihe àjà-ya; 16 i we lutara umu-gi ndikom ufọdu nime umu-ha ndinyom, umu-ha ndinyom we so chi-ha nākwa iko, me kwa ka umu-gi ndikom soro chi-ha nākwa iko. 17 Gi emerela onwe-gi chi akpuru akpu. 18 Ememe achicha ekoghi-eko ka i gēdebe. Ubọchi asa ka i gēri achicha ekoghi-eko, dika M'nyere gi iwu, na mb͕e akara àkà n'ọnwa Ebib: n'ihi na ọ bu nime ọnwa Ebib ka i siri n'Ijipt puta. 19 Nwa ọ bula nke meghere àkpà-nwa bu nkem; na anu-ulo-gi ọ bula nke bu oké, nwa nke meghere àkpà-nwa ehi ma-ọbu aturu. 20 Ma nwa inyinya-ibu nke meghere àkpà-nwa, i gēwere nwa-aturu b͕aputa ya: ma ọ buru na i b͕aputaghi ya, i gāb͕aji kwa olu-ya. Ọkpara ọ bula n'etiti umu-gi ka i gāb͕aputa. Ma ọ dighi onye agāhu n'irum ka ọ b͕a aka. 21 Ubọchi isi ka i gālu ọlu-gi, ma n'ubọchi nke-asa i gākwusi: n'ilu-ọlu-ubi na n'owuwe-ihe-ubi i gākwusi. 22 I gēme-kwa-ra onwe-gi ememe nke izù asa nke ubọchi asa, bú nke nkpuru mbu nke obìbì ọka wheat, na ememe nke nchikọta-ihe n'ọb͕ub͕a arọ. 23 Ub͕ò atọ n'arọ ka agāhu ndikom-i nile n'iru Onye-nwe-unu Jehova, bú Chineke nke Israel. 24 N'ihi na M'gānara mba di iche iche ala-ha n'iru gi, me ka ókè-ala-gi nile sa mbara: ọ dighi kwa onye ọ bula gēnwe anya-uku n'ebe ala-gi di, mb͕e i nārigo ka ewe hu gi n'iru Jehova, bú Chineke-gi, ub͕ò atọ n'arọ. 25 Eb͕upula ọbara nke àjàm n'elu ihe nēko achicha; àjà ememe ngabiga agaghi-adigide kwa abali nile rue ututu. 26 Ihe mbu nke nkpuru mbu nke ala-ubi-gi ka i gēwebata n'ulo nke Jehova, bú Chineke-gi. Esila nwa-ewu nime miri-ara nke nne-ya. 27 Jehova we si Moses, Dere onwe-gi okwu ndia n'ihe: n'ihi na dika okwu ndia si di ka M'b͕aworo ndu n'etiti Mu na gi, na n'etiti Mu na umu Israel. 28 Ọ we nọ n'ebe ahu, ya na Jehova, ọgu ubọchi abua ehihie na abali; ọ dighi nri o riri, ọ dighi kwa miri ọ ṅuru. Ọ we de n'elu mbadamba nkume abua ahu okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu ahu, bú okwu iri ahu. 29 O rue, mb͕e Moses siri n'ugwu Sainai rida (mbadamba nkume abua nke ihe-àmà ahu di kwa n'aka Moses mb͕e o siri n'ugwu ahu rida), na Moses amaghi na akpukpọ iru-ya nēnwuputa ìhè mb͕e Ọ kpayere ya uka. 30 Eron na umu Israel nile we hu Moses, ma, le, akpukpọ iru-ya nwuputara ìhè; ha we tua egwu ibiaru ya nso. 31 Moses we kpọ ha òkù; Eron na ndi-isi nile nime nzukọ ahu we laghachikute ya: Moses we gwa ha okwu. 32 Emesi kwa umu Israel nile biaruru nso, ọ we nye ha n'iwu uka nile nke Jehova kpayere ya n'ugwu Sainai. 33 Moses we gwabìe ha okwu, kpudo ihe-nkpudo n'iru-ya. 34 Ma mb͕e ọ bula Moses bara nime n'iru Jehova ikpayere Ya uka, ọ wezuga ihe-nkpudo ahu rue mb͕e ọ putara: ọ we puta, gwa umu Israel ihe nke enyere ya n'iwu; 35 umu Israel we hu iru Moses, na akpukpọ iru Moses nēnwuputa ìhè: Moses we kpughachi ihe-nkpudo ahu n'iru-ya, rue mb͕e ọ bara nime ikpayere Ya uka.

Ọpupu 35

1 Moses we kpọkọta nzukọ nile nke umu Israel, si ha, Ndia bu okwu nke Jehova nyeworo n'iwu, ka unu me ha. 2 Ubọchi isi ka agēje ozi, ma n'ubọchi nke-asa unu gēnwe ubọchi nsọ, bú ubọchi-izu-ike nke idebe-ubọchi-izu-ike Jehova nwere: onye ọ bula nke nēje ozi nime ya, agēme ka ọ nwua. 3 Unu afunwula ọku n'ebe-obibi-unu nile n'ubọchi-izu-ike. 4 Moses we gwa nzukọ nile nke umu Israel okwu, si, Nka bu ihe Jehova nyere n'iwu, si, 5 Sinu n'etiti unu wetara Jehova àjà-nbuli: onye ọ bula nke obi-ya nwere afọ-ofufo, ya weta ya, bú àjà-nbuli nke Jehova; ọla-edo, na ọla-ọcha, na ọla; 6 na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha, na aji ewu; 7 na akpukpọ ebulu esijiri ọbara-ọbara, na akpukpọ seal, na osisi acacia; 8 na manu itiye n'ihe nēnye ìhè, na uda di iche iche itiye na manu nke otite-manu ahu, na ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me; 9 na nkume onyx, na nkume ihiọgide n'ihe, ihiọgide n'ephod, na ihiọgide n'ihe-ib͕ochi-obi. 10 Onye ọ bula n'etiti unu nke nwere obi amam-ihe, ha gābia kwa, me ihe nile nke Jehova nyere n'iwu; 11 ebe-obibi ahu, na ulo-ikwū-ya, na ákwà-nkpuchi-ya, na nko-ya nile, na ibo-ya nile, na nkpọrọ-ya nile, na ide-ya nile, na ukwu-ya nile, 12 na ib͕e ahu, na nkpa-n'aka-ya abua, na ebe-nkpuchi-nmehie, na ákwà-nb͕ochi nke ákwà-nkwuchi; 13 na table ahu, na nkpa-n'aka-ya abua, na ihe-ya nile, na achicha iru Chineke; 14 na ihe-idọba-oriọna nke ihe nēnye ìhè, na ihe-ya nile, na oriọna-ya nile, na manu itiye n'ihe nēnye ìhè; 15 na ebe-ichu-àjà nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na nkpa-n'aka-ya abua, na manu nke otite-manu ahu, na ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me, na ákwà-nkwuchi ọnu-uzọ n'ọnu-uzọ nke ebe-obibi ahu; 16 na ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku, na ihe-ọkpukpa ọla nke diri ya, na nkpa-n'aka-ya abua, na ihe-ya nile, na ite ọsisa-miri ahu, na ukwu-ala-ya; 17 na ákwà-ngechi nile nke ogige, na ide-ya nile, na ukwu-ha, na ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ-ama nke ogige ahu: 18 na ǹtú nile nke ebe-obibi ahu; na ǹtú nile nke ogige, na udọ̀ nile ha; 19 na uwe nile akpara nke-ọma, iji je ozi n'ebe nsọ ahu, na uwe nsọ nile Eron, bú onye-nchu-àjà, nwere, na uwe umu-ya ndikom, ibu ndi-nchu-àjà. 20 Nzukọ nile nke umu Israel we si n'iru Moses pua. 21 Ha we bia, onye ọ bula nke obi-ya kwaliri ya, na onye ọ bula nke mọ-ya mere ka o nwe afọ-ofufo, ha we weta àjà-nbuli Jehova, iji je ozi ulo-ikwū nzute ahu, na iji fè òfùfè-ya nile, na iji me uwe nsọ ahu. 22 Ha we bia, ma ndikom ma ndinyom, onye ọ bula nke obi-ya nwere afọ-ofufo, ha we weta ihe-nkpọchi-uwe, na nb͕a-aka imi, na nb͕a-aka-akàrà, na ihe anēyi n'olu, ihe ọla-edo ọ bula; bú onye ọ bula nke fere àjà-ofufé ọla-edo nye Jehova. 23 Onye ọ bula nke achọtara n'aka-ya ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha, na aji ewu, na akpukpọ ebulu esijiri ọbara-ọbara, na akpukpọ seal, chitara ha. 24 Onye ọ bula nke nēbuli àjà-nbuli nke ọla-ọcha na ọla wetara àjà-nbuli nke Jehova: nwoke ọ bula, nke achọtara osisi acacia n'aka-ya iji je ozi nke òfùfè ahu, we weta ya. 25 Nwayi ọ bula nke nwere obi amam-ihe were kwa aka-ya tu ogho, ha we weta ogho nke ha turu, bú ogho anunu ahu, na ogho ododo ahu, na ogho uhie ahu, na ezi ákwà ọcha ahu. 26 Ndinyom nile ndi obi-ha kwaliri ha n'amam-ihe tu-kwa-ra aji ewu. 27 Ndi-isi chitara nkume onyx, na nkume ihiọgide n'ihe, ihiọgide n'ephod ahu, na ihiọgide n'ihe-ib͕ochi-obi ahu; 28 na uda ahu, na manu ahu; itiye n'ihe nēnye ìhè, na ibu manu nke otite-manu ahu, na ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me. 29 Nwoke ọ bula na nwayi ọ bula, ndi obi-ha mere ka ha nwe afọ-ofufo iweta ihe iji je ozi nile, nke Jehova nyere iwu ka eme n'aka Moses, umu Israel ahu wetara onyinye afọ-ofufo nye Jehova. 30 Moses we si umu Israel, Lenu, Jehova akpọwo Bezalel n'aka, bú nwa Uri, nwa Hua, nke ebo Juda; 31 Ọ mejuwo kwa ya na Mọ nke Chineke, n'amam-ihe, na nime nghọta, na n'ihe-ọmuma, na n'ije-ozi ọ bula; 32 ya na icheputa ọlu onye-ọ̀kà di iche iche, ilu ọlu n'ọla-edo, na n'ọla-ọcha, na n'ọla, 33 na n'ilu ọlu onye-ọ̀ka na nkume ihiọgide ahiọgide, na n'ilu ọlu onye-ọ̀kà n'osisi, ilu ọlu n'ije-ozi ọ bula nke onye-ọ̀kà. 34 Ọ bu kwa izí ihe ka O tiyeworo n'obi-ya, ya onwe-ya na Ọhọliab, bú nwa Ahisamak, nke ebo Dan. 35 O me-juwo ha n'amam-ihe nke obi, ije ozi ọ bula, nke onye nātu akika, na nke onye-ọ̀kà, na nke onye-ọdudu-ákwà, bú n'ogho anunu, na n'ogho ododo, na n'ogho uhie, na n'ezi ákwà ọcha, na nke ọkpa-ákwà, bú ije ozi nke ndi nēje ozi ọ bula, na nke ndi nēcheputa ọlu onye-ọ̀kà di iche iche.

Ọpupu 36

1 Bezalel na Ọhọliab gālu kwa ọlu, ha na nwoke ọ bula nke nwere obi amam-ihe, ndi Jehova tiyeworo amam-ihe na nghọta nime ha ka ha mara ije ozi ọ bula nke òfùfè nke ebe nsọ ahu, dika ihe nile si di nke Jehova nyere n'iwu. 2 Moses we kpọ Bezalel na Ọhọliab, na nwoke ọ bula nwere obi amam-ihe, onye Jehova tiyere amam-ihe n'obi-ya, onye ọ bula nke obi-ya kwaliri ya ibiaru nso ozi ahu ije ya: 3 ha we si n'iru Moses were ihe àjà-nbuli ahu nile nke umu Israel wetara iji je ozi nke òfùfè nke ebe nsọ ahu, ime ya. Ma ndi Israel ahu nọ n'iwetara ya onyinye-afọ-ofufo kwa-ututu. 4 Ndi-amam-ihe ahu nile, ndi nēje ozi nile nke ebe nsọ ahu, ha nile n'otù n'otù we si n'ozi-ha nke ha nēje bia, 5 gwa Moses okwu, si, Ndi Israel nēweta ọtutu ihe kari nke gēzuru òfùfè nke diri ozi ahu nke Jehova nyere iwu ka eje ya. 6 Moses we nye iwu, ha we me ka ekwusa ya n'ọmuma-ulo-ikwū nile, si, Nwoke ma-ọbu nwayi, ka ha ghara ije ozi ọzọ bayere àjà-nbuli nke ebe nsọ ahu. Ewe me ka ndi Israel wetabìe ihe. 7 Ihe-ije-ozi ahu we zuere ha iji je ozi nile, ime ya, ihe we fọdu. 8 Onye ọ bula nke nwere obi amam-ihe n'etiti ndi nēje ozi ahu we me ebe-obibi ahu: were ákwà-nkwuba iri me ya; ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, nke emere ka ha yie cherubim, bú ọlu nke onye-ọ̀kà, ihe ndia ka o ji me ha. 9 Ogologo nke otù ákwà-nkwuba di orú cubit na asatọ, obosara nke otù ákwà-nkwuba di kwa cubit anọ: otù ọtùtù ka ákwà-nkwuba nile nwere. 10 O we jikọta ákwà-nkwuba ise, otù na ibe-ya: jikọta kwa ákwà-nkwuba ise nke-ọzọ, otù na ibe-ya. 11 O ji kwa ogho anunu me anya-nko n'elu ọnu-ọnu nke otù ákwà-nkwuba, site na nsọtu-ya nime njikọta ahu: otú a ka ọ me-kwa-ra n'ọnu-ọnu ákwà-nkwuba nke dipuru adipu nime njikọta nke-abua. 12 Ọgu anya-nko abua na iri ka o mere n'otù ákwà-nkwuba, ọgu anya-nko abua na iri ka ọ me-kwa-ra nime nsọtu nke ákwà-nkwuba nke di na njikọta nke-abua: anya-nko cheritara onwe-ha iru, otù na ibe-ya. 13 O me-kwa-ra ọgu nko ọla-edo abua na iri, were nko ahu jikọta ákwà-nkwuba, otù na ibe-ya: ebe-obibi ahu we buru otù. 14 O me-kwa-ra ákwà-nkwuba aji ewu, ibu ulo-ikwū n'elu ebe-obibi ahu: ákwà-nkwuba iri na otù ka o mere ha. 15 Ogologo nke otù ákwà-nkwuba di orú cubit na iri, cubit anọ ka obosara nke otù ákwà-nkwuba di kwa: otù ọtùtù ka ákwà-nkwuba iri na otù ahu nwere. 16 O jikọta-kwa-ra ákwà-nkwuba ise iche, na ákwà-nkwuba isi iche. 17 O me-kwa-ra ọgu anya-nko abua na iri n'elu ọnu-ọnu nke ákwà-nkwuba ahu dipuru adipu nime njikọta ahu, ọ me-kwa-ra ọgu anya-nko abua na iri n'elu ọnu-ọnu nke ákwà-nkwuba nke dipuru adipu nime njikọta nke-abua. 18 O me-kwa-ra ọgu nko ọla abua na iri, ijikọta ulo-ikwū ahu ka ọ we buru otù. 19 O were mere ulo-ikwū ahu ihe-nkpuchi akpukpọ ebulu esijiri ọbara-ọbara, ya na ihe-nkpuchi akpukpọ seal n'elu ya. 20 O we mere ebe-obibi ahu ibo osisi acacia, nke nēguzo ọtọ. 21 Cubit iri ka ogologo nke otù ibo di, otù cubit na nkera cubit ka obosara nke otù ibo di kwa. 22 Otù ibo nwere ihe-nhiọye abua, nke ekwukọtara, otù na ibe-ya: otú a ka o mere nye ibo nile nke ebe-obibi ahu. 23 O we mere ebe-obibi ahu ibo ahu; orú ibo ka ọ mere nye akuku Ndida chere iru na Ndida: 24 ọgu ukwu ọla-ọcha abua ka o me-kwa-ra n'okpuru orú ibo ahu; ukwu abua n'okpuru otù ibo inara ihe-nhiọye-ya abua, ukwu abua kwa n'okpuru ibo ọzọ inara ihe-nhiọye-ya abua. 25 O we mere akuku nke-abua nke ebe-obibi ahu orú ibo, bú akuku Ugwu, 26 na ọgu ukwu ọla-ọcha ha abua; ukwu abua n'okpuru otù ibo, ukwu abua kwa n'okpuru ibo ọzọ. 27 Isi ebe-obibi ahu nke chere iru n'Ọdida-anyanwu ka o me-kwa-ra ibo isi nye. 28 Ibo abua ka o me-kwa-ra nye nkuku ebe-obibi ahu n'isi-ya. 29 Ha bu ihe abua ejikọtara n'otù n'okpuru, ha abua bu kwa otù ihe zuru okè rue isi-ya rue otù nb͕a-aka ahu: otú a ka o mere nye ha abua na nkuku abua ahu. 30 Ha di kwa ibo asatọ, na ukwu ọla-ọcha ha, ukwu iri na isi; ukwu abua n'okpuru otù ibo, ukwu abua kwa n'okpuru ibo ọzọ. 31 O me-kwa-ra nkpọrọ osisi acacia; ise ka o mere nye ibo otù akuku nke ebe-obibi ahu, 32 nkpọrọ ise ka o me-kwa-ra nye ibo akuku nke-ọzọ nke ebe-obibi ahu, nkpọrọ ise ka o me-kwa-ra nye ibo nke ebe-obibi ahu, bú isi-ya chere iru n'Ọdida-anyanwu. 33 O we me ka nkpọrọ etiti gabiga n'etiti ibo ahu, si n'otù nsọtu rue nsọtu ọzọ. 34 Ọ machita-kwa-ra ibo nile ọla-edo, were kwa ọla-edo me nb͕a-aka-ha, ka ha buru ọnọdu itiye nkpọrọ ahu, ọ machita-kwa-ra nkpọrọ ahu ọla-edo. 35 O we me ákwà-nb͕ochi ahu nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma: ọ bu ọlu onye-ọ̀kà, o mere ya ka o yie cherubim. 36 O we mere ya ide acacia anọ, machita ha ọla-edo: nkpọye-ha bu ọla-edo; o we wuara ha ukwu ọla-edo anọ. 37 O we mere ọnu-uzọ Ulo-ikwū ahu ákwà-nkwuchi, nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, ọ bu ọlu onye-ọdudu-ákwà; 38 o me-kwa-ra ide ise ya na nkpọye-ha, machita isi-ha na ngegide-ha ọla-edo: ma ukwu ise ha bu ọla.

Ọpupu 37

1 Bezalel me-kwa-ra ib͕e osisi acacia: cubit abua na nkera ka ogologo-ya di, otù cubit na nkera ka obosara-ya di kwa, otù cubit na nkera ka elu-ya di kwa: 2 ọ machita ya ọla-edo anāgwaghi agwa, nime na azu ka ọ machitara ya, o we mere ya mpempe ọla-edo buruburu 3 O we wuara ya nb͕a-aka ọla-edo anọ, n'ukwu anọ ya; bú nb͕a-aka abua n'otù akuku-ya, na nb͕a-aka abua n'akuku-ya ọzọ. 4 O me-kwa-ra nkpa-n'aka osisi acacia, machita ha ọla-edo. 5 O we me ka nkpa-n'aka ahu ba na nb͕a-aka ahu n'elu akuku ib͕e ahu, iji ebu ib͕e ahu. 6 O me-kwa-ra ebe-nkpuchi-nmehie nke ọla-edo anāgwaghi agwa: cubit abua na nkera ka ogologo-ya di, otù cubit na nkera ka obosara-ya di. 7 O me-kwa-ra cherubim ọla-edo abua; ihe akpuru akpu ka o mere ha, na nsọtu abua nke ebe-nkpuchi-nmehie; 8 otù cherub n'otù nsọtu, na otù cherub na nsọtu nke-ọzọ: site n'ebe-nkpuchi-nmehie ka o mere cherubim ahu, na nsọtu-ya abua. 9 Cherubim ahu nāb͕asa kwa nkù-ha n'elu, nēkpuchi ebe-nkpuchi-nmehie na nkù-ha, iru-ha nēcherita kwa onwe-ha; n'ebe ebe-nkpuchi-nmehie di ka iru cherubim ahu di. 10 O me-kwa-ra table osisi acacia ahu: cubit abua ka ogologo-ya di, otù cubit ka obosara-ya di, otù cubit na nkera ka idi-elu-ya di: 11 ọ machita ya ọla-edo anāgwaghi agwa, me-kwa-ra ya mpempe ọla-edo buruburu. 12 O me-kwa-ra ya ihe-njìkọ buruburu nke ra ka otù ọbu-aka, mere ihe-njikọ-ya mpempe ọla-edo buruburu. 13 Ọ wuara ya nb͕a-aka ọla-edo anọ, tukwasi nb͕a-aka ahu na nkuku anọ nke di n'ukwu anọ ya. 14 Na nso ihe-njikọ ahu ka nb͕a-aka di, ka ha buru ọnọdu itiye nkpa-n'aka eji ebu table ahu. 15 O ji kwa osisi acacia me nkpa-n'aka ahu, ọ machita ha ọla-edo, iji ebu table ahu. 16 O me-kwa-ra ihe nile nke di n'elu table, bú afere-ya nile, na ngaji-ya nile, na ọkwa-ya nile, na iko-ya nile, nke eji awusi àjà-ihe-ọṅuṅu: ọla-edo anāgwaghi agwa ka ha bu. 17 O me-kwa-ra ihe-idọba-oriọna ahu nke ọla-edo anāgwaghi agwa: ihe akpuru akpu ka o mere ihe-idọba-oriọna ahu, bú ukwu-ala-ya na alaka-ya; iko-ya nile, bú isi-ya nile, na okoko-ya nile, sitere na ya: 18 alaka isi nēsi n'akuku-ya abua waputa; alaka atọ nke ihe-idọba-oriọna ahu n'otù akuku-ya, alaka atọ nke ihe-idọba-oriọna ahu kwa n'akuku-ya nke-ọzọ: 19 iko atọ emere dika ifuru osisi almond di n'otù alaka, otù isi na otù okoko; iko atọ emere dika ifuru osisi almond di kwa n'alaka-ibe-ya, otù isi na otù okoko: otú a ka ọ diri alaka isi ahu nke nēsi n'ihe-idọba-oriọna ahu waputa. 20 iko anọ emere dika ifuru osisi almond di kwa n'ihe-idọba-oriọna ahu, isi-ha na okoko-ha: 21 otù isi di kwa n'okpuru alaka abua site na ya, otù isi di kwa n'okpuru alaka abua site na ya, otù isi di kwa n'okpuru alaka abua site na ya, diri alaka isi ahu nke nēsi nime ya waputa. 22 Isi-ha na alaka-ha sitere na ya; ihe-idọba-oriọna ahu nile bu otù ihe eji ọla-edo nke anāgwaghi agwa kpu. 23 O me-kwa-ra oriọna-ya, ha di asa, na nkpa-ya nile, na ihe-ikpakepu-ọku-ya nile, ha bu ọla-edo anāgwaghi agwa. 24 Otù talent nke ọla-edo anāgwaghi agwa ka o ji me ya, ya na ihe-ya nile. 25 O me-kwa-ra ebe-ichu-àjà ahu nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, osisi acacia ka ọ bu: otù cubit ka ogologo-ya di, otù cubit ka obosara-ya di kwa, ihe nwere akuku anọ ra nrata ka ọ bu; cubit abua ka idi-elu-ya di kwa; mpi-ya nile sitere na ya. 26 Ọ machita ya ọla-edo anāgwaghi agwa, elu-ya, na akuku-ya nile buruburu, na mpi-ya nile: o we mere ya mpempe ọla-edo buruburu. 27 Nb͕a-aka ọla-edo abua ka o me-kwa-ra nye ya n'okpuru mpempe-ya, n'elu ihe-akuku-ya abua, n'elu akuku-ya abua, ka ha buru ọnọdu inara nkpa-n'aka eji ebu ya. 28 O ji kwa osisi acacia me nkpa-n'aka ahu, ọ machita ha ọla-edo. 29 O me-kwa-ra manu otite-manu ahu di nsọ, na ihe-nsure-ọku ahu nēsì ísì utọ nke anāgwaghi agwa, bú nke eji uda utọ di iche iche me, bú ọlu onye nāsugwa manu-otite nēsì ísì utọ.

Ọpupu 38

1 O me-kwa-ra ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku ahu, ọ bu osisi acacia: cubit ise ka ogologo-ya di, cubit ise ka obosara-ya di kwa, o nwere akuku anọ ra nrata; cubit atọ ka idi-elu-ya di kwa. 2 O me-kwa-ra mpi-ya n'elu nkuku anọ ya; mpi-ya sitere na ya: ọ machita ya ọla. 3 O me-kwa-ra ihe nile nke ebe-ichu-aja ahu, bú ite-ya nile, na osekè-ya nile, na ọkwa-nwusa-ya nile, na ndudu-ya nile, na ihe-igu-ọku-ya nile: ihe-ya nile ka o ji ọla me. 4 O we mere ebe-ichu-àjà ahu ihe-ọkpukpa, ihe eji ub͕u ọla me, n'okpuru ebe dipuru adipu buruburu ya n'okpuru, rue na nkera-ya. 5 O we wuara nsọtu anọ nke ihe-ọkpukpa ọla ahu nb͕a-aka anọ, ibu ọnọdu inara nkpa-n'aka-ya abua. 6 O me-kwa-ra nkpa-n'aka osisi acacia, machita ha ọla. 7 O me ka nkpa-n'aka ahu ba na nb͕a-aka ahu n'elu akuku abua nke ebe-ichu-àjà ahu, ka ewe were ha nēbu ya; o were ibo me ya ka ọ di ka ib͕e. 8 O me-kwa-ra ite ọsisa-miri, ọ bu ọla, ukwu-ala-ya bu kwa ọla: ọ bu enyo nke ndinyom nēzukọ n'usu n'usu, ndi nēzukọ n'usu n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, ka o ji me ya. 9 O me-kwa-ra ogige ahu: akuku Ndida nke chere iru na Ndida nwere ákwà-ngechi ogige ahu nke ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, ọgu cubit ise n'ogologo: 10 ide-ha di orú, ukwu-ha di kwa orú, ha bu ọla; nkpọye nile nke ide ahu na ngegide nile ha bu ọla-ọcha. 11 Akuku Ugwu nwe-kwa-ra ọgu cubit ise, ide-ha di orú, ukwu-ha di kwa orú, ha bu ọla; nkpọye nile nke ide ahu na ngegide nile ha bu ọla-ọcha. 12 Akuku Ọdida-anyanwu nwe-kwa-ra ákwà-ngechi nke ọgu cubit abua na iri, ide-ha di iri, ukwu-ha di kwa iri; nkpọye nile nke ide ahu na ngegide nile ha bu ọla-ọcha. 13 Akuku Iru-anyanwu chere iru n'ọwuwa-anyanwu, nwekwara ọgu cubit abua na iri. 14 Ákwà-ngechi cubit iri na ise ka otù akuku ọnu-uzọ-ama-ya nwere; ide-ha di atọ, ukwu-ha di kwa atọ; 15 akuku nke-ọzọ nke ọnu-uzọ-ama-ya nwekwara: n'aka-nri na n'aka-ekpe nke ọnu-uzọ-ama ogige ahu ka ákwà-ngechi cubit iri na ise di; ide-ha di atọ, ukwu-ha di kwa atọ. 16 Ákwà-ngechi nile nke ogige ahu buruburu bu ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma. 17 Ukwu nile nke ide ahu nwere bu ọla; nkpọye nile nke ide na ngegide nile ha bu ọla-ọcha; ihe amachitara isi-ha bu kwa ọla-ọcha; ihe ahu bu kwa ihe egegidere ngegide ọla-ọcha, bú ide nile nke ogige ahu. 18 Ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ-ama ogige ahu bu ọlu onye-ọdudu-ákwà, nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma: orú cubit ka ogologo-ya di, idi-elu-ya nime obosara-ya di cubit ise, dika ákwà-ngechi nke ogige ahu. 19 Ide-ha di anọ, ukwu-ha di kwa anọ, ha bu ọla; nkpọye nile ha bu ọla-ọcha, ihe-nmachita nke isi-ha na ngegide nile ha bu kwa ọla-ọcha. 20 Ma ǹtú nile ebe-obibi ahu nwere, na nke ogige ahu buruburu nwere, bu ọla. 21 Ndia bu ngukọta ihe ebe-obibi ahu, bú ebe-obibi nke ihe-àmà ahu, dika agukọtara ha, n'okwu-ọnu Moses, ọ bu òfùfè nke ndi Livai, site n'aka Itama, bú nwa Eron onye-nchu-àjà. 22 Ma Bezalel nwa Uri, nwa Hua, nke ebo Juda, mere ihe nile Jehova nyere Moses n'iwu. 23 Ma onye soro ya n'ọlu ahu bu Ọhọliab, nwa Ahisamak, nke ebo Dan, bú onye nātu akika, na onye-ọ̀kà, na onye-ọdudu-ákwà n'ogho anunu, na n'ogho ododo, na n'ogho uhie, na n'ezi ákwà ọcha. 24 Ọla-edo nile nke ejiri je ozi ahu n'ije-ozi nile nke ebe nsọ ahu, bú ọla-edo nke àjà-ofufé ahu, di orú talent na iteghete, na nnù shekel na ọgu iri na ọgu isi na iri, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di. 25 Ọla-ọcha nke ndi agukọtara agukọta n'etiti nzukọ Israel di ọgu talent ise, na nnù shekel anọ na ọgu asatọ na iri na ise, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di: 26 otù beka otù isi, ya bu nkera shekel, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di, enyere n'isi onye ọ bula nke nāgabiga n'ebe ndi agukọtara agukọta nọ, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, n'isi orú nnù ọgu uzọ atọ na uzọ iri-na-ise, na nnù asatọ, na ọgu iri-na-asa, na iri. 27 Ọgu talent ọla-ọcha ise ahu we buru iwu ukwu nile nke ibo nke ebe nsọ ahu, na ukwu nile nke ide nke ákwà-nb͕ochi ahu; ọgu ukwu ise ka ọgu talent ise ahu nwere, otù talent diri otù ukwu. 28 Nnù shekel anọ na ọgu asatọ na iri na ise ahu ka o ji kwa mere ide ahu nile nkpọye, machita kwa isi-ha, mekwara ha ihe-ngegide. 29 Ọla nke àjà-ofufé ahu di kwa ọgu talent atọ na iri, na nnù shekel isi. 30 O ji ya me ukwu nile nke ide ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, na ebe-ichu-àjà ọla, na ihe-ọkpukpa ọla nke diri ya, na ihe nile nke ebe-ichu-aja ahu, 31 na ukwu nile nke ide ogige ahu buruburu, na ukwu nile nke ide ọnu-uzọ-ama ogige ahu, na ǹtú nile nke ebe-obibi ahu, na ǹtú nile nke ogige ahu buruburu.

Ọpupu 39

1 Ha site-kwa-ra n'ogho anunu ahu, na ogho ododo ahu, na ogho uhie ahu, me uwe nile akpara nke-ọma, iji je ozi n'ebe nsọ ahu, me kwa uwe nsọ nile nke Eron nwere; dika Jehova nyere Moses iwu. 2 Ọ mekwara ephod ahu, ọ bu ọla-edo, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma. 3 Ha we tisa mbadamba ihe ọla-edo ahu, we bìri ya ka ọ buru eriri, ikpa n'etiti ogho anunu ahu, na n'etiti ogho ododo ahu, na n'etiti ezi ákwà ọcha ahu, ọ bu ọlu onye-ọ̀kà. 4 Ha we mere ya ubu abua ejikọtara: na nsọtu-ya abua ka ejikọtara ya. 5 Ihe-ọkiké ahu nke onye-ọ̀kà kpara, nke di n'elu ya, nke eji ke ya, o site-kwa-ra na ya, ọ di kwa ka ọlu aluru ya si di; ọ bu ọla-edo, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma; dika Jehova nyere Moses iwu. 6 Ha mekwara nkume onyx ahu, nke emere ka ihe ọla-edo akpara akpà b͕a ha buruburu, nke eb͕uru ha eb͕ub͕u nb͕a-aka-akàrà, dika aha umu Israel si di. 7 O tiye ha n'elu ubu ephod, iburu umu Israel nkume ncheta: dika Jehova nyere Moses iwu. 8 Ọ mekwara ihe-ib͕ochi-obi ahu, ọ bu ọlu nke onye-ọ̀kà, dika ọlu aluru n'ephod ahu; ọla-edo, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma. 9 Ihe nwere akuku anọ ra nrata ka o bu; ha mere ihe-ib͕ochi-obi ahu ka ọ buru ihe apiajiri apiaji: ntù-aka ka ogologo-ya di, ntù-aka ka obosara-ya di kwa, mb͕e apiajiri ya. 10 Ha hiọgide-kwa-ra nime ya ariri nkume anọ: ariri sardius na topaz na carbuncle bu ariri mbu. 11 Ariri nke-abua bu emerald na sapphire na diamond. 12 Ariri nke-atọ bu jacinth na agate na amethyst. 13 Ariri nke-anọ bu beryl na onyx na jasper: etiyere ha n'ọla-edo akpara akpà n'ebe-nhiọgide-ha. 14 Nkume ahu di ka aha umu Israel si di, iri na abua, dika aha-ha si di; dika eb͕ub͕u nb͕a-aka-akàrà, onye ọ bula dika aha-ya si di, ha diri ebo iri na abua ahu. 15 Ha mekwara n'elu ihe-ib͕ochi-obi ahu iyab͕a emere dika eriri-nma, bú ihe emere dika udọ̀ aturu atu, ha bu ọla-edo anāgwaghi agwa. 16 Ha me-kwa-ra ihe ọla-edo abua akpara akpà, na nb͕a-aka ọla-edo abua: ha we tiye nb͕a-aka abua ahu n'elu nsọtu abua nke ihe-ib͕ochi-obi. 17 Ha tiye-kwa-ra iyab͕a ọla-edo abua ahu aturu atu dika udọ̀ n'elu nb͕a-aka abua ahu di na nsọtu abua nke ihe-ib͕ochi-obi ahu. 18 Nsọtu abua ọzọ nke iyab͕a abua ahu aturu atu dika udọ̀, ha tiye-kwa-ra ha n'elu ihe ọla-edo abua ahu akpara akpà, tiye ha n'elu ubu ephod ahu, n'ebe iru-ya di. 19 Ha mekwara nb͕a-aka ọla-edo abua, tukwasi ha n'elu nsọtu abua nke ihe-ib͕ochi-obi ahu, n'ọnu-ọnu-ya, nke chere iru n'akuku ephod ahu nime. 20 Ha mekwara nb͕a-aka ọla-edo abua, tiye ha n'elu ubu abua nke ephod n'okpuru, n'ebe iru-ya di, na nso njikọta-ya, n'elu ihe-ọkiké ephod nke onye-ọ̀kà kpara. 21 Ha were kwa eriri-nma ogho anunu ke ihe-ib͕ochi-obi ahu na nb͕a-aka ephod site na nb͕a-aka-ya, ka ọ we di n'elu ihe-ọkiké ephod ahu nke onye-ọ̀kà kpara, ya na ka ewe ghara isi n'ephod tọpu ihe-ib͕ochi-obi ahu; dika Jehova nyere Moses iwu. 22 Ó mekwara uwe-nwuda ephod, ọ bu ọlu ọkpa-akwà, ọ busi ogho anunu ogho anunu; 23 ọnu uwe-nwuda ahu di n'etiti ya, dika ọnu nke uwe-obi agha, ọnu-ọnu ka ọnu-ya nwere buruburu, ka ewe ghara idọwa ya. 24 Ha mekwara n'ọnu-ọnu-ala uwe-nwuda ahu pomegranate nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ákwà akpara nke-ọma. 25 Ha mekwara ataṅu ọla-edo anāgwaghi agwa, tiye ataṅ ahu n'etiti pomegranate ahu n'elu ọnu-ọnu-ala uwe-nwuda ahu buruburu, n'etiti pomegranate ahu; 26 otù ataṅu na otù pomegranate, otù ataṅ na otù pomegranate, di n'ọnu-ọnu-ala uwe-nwuda ahu buruburu, iji je ozi; dika Jehova nyere Moses iwu. 27 Ha we mere Eron, mekwara umu-ya ndikom, uwe-ime ahu, ha bu ezi ákwà ọcha, ọlu nke ọkpa-ákwà, 28 na ákwà-nkukù-isi ahu, ọ bu ezi ákwà ọcha, na ihe ahu mara nma ike n'isi, ha bu ezi ákwà ọcha, na uwe-ukwu ahu nke ezi ákwà ọcha, ha bu ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, 29 na ihe ahu ike n'úkwù, ọ bu ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, ọ bu ọlu nke onye-ọdudu-ákwà; dika Jehova nyere Moses iwu. 30 Ha mekwara ihe di mbara nke okpu nsọ ahu nke onye-nchu-àjà, ọ bu ọla-edo anāgwaghi agwa, ha de ihe-odide n'elu ya, dika eb͕ub͕u nb͕a-aka-akàrà, IHE NSỌ JEHOVA NWERE. 31 Ha tiye-kwa-ra n'elu ya eriri-nma ogho anunu, itiye ya n'elu ákwà-nkukù-isi ahu n'elu; dika Jehova nyere Moses iwu. 32 Ewe me ka òfùfè nile nke ebe-obibi nke ulo-ikwū nzute gwusia: umu Israel we me dika ihe nile si di nke Jehova nyere Moses n'iwu, otú a ka ha mere. 33 Ha we butere Moses ebe-obibi ahu, Ulo-ikwū ahu, na ihe-ya nile, nko-ya nile, na ibo-ya nile, na nkpọrọ-ya nile, na ide-ya nile, na ukwu-ya nile; 34 na ihe-nkpuchi akpukpọ ebulu esijiri ọbara-ọbara, na ihe-nkpuchi akpukpọ seal, na ákwà-nb͕ochi nke ákwà-nkwuchi-ya; 35 na ib͕e ihe-àmà ahu, na nkpa-n'aka-ya abua, na ebe-nkpuchi-nmehie ahu; 36 na table ahu, na ihe-ya nile, na achicha nke iru Chineke; 37 na ihe-idọba-oriọna ahu nke bu ọla-edo anāgwaghi agwa, na oriọna-ya nile, bú oriọna nke ido n'usoro, na ihe-ya nile, na manu nke ihe nēnye ìhè; 38 na ebe-ichu-àjà ọla-edo ahu, na manu otite-manu ahu, na ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me, na ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ Ulo-ikwū ahu; 39 na ebe-ichu-àjà ọla ahu, na ihe-ọkpukpa ọla nke o nwere, na nkpa-n'aka-ya abua, na ihe-ya nile, na ite ọsisa-miri ahu, na ukwu-ala-ya; 40 na ákwà-ngechi nile nke ogige ahu, na ide-ya nile, na ukwu ide-ya, na ákwà-nkwuchi ọnu-uzọ-ama ogige ahu nwere, na udọ̀-ya nile, na ǹtú-ya nile, na ihe nile nke òfùfè ebe-obibi ahu, nke diri ulo-ikwū nzute ahu; 41 na uwe nile akpara nke-ọma, iji je ozi n'ebe nsọ ahu, na uwe nsọ nile Eron onye-nchu-àjà nwere, na uwe nile nke umu-ya ndikom, ibu ndi-nchu-àjà. 42 Dika ihe nile Jehova nyere Moses n'iwu si di, otú a ka umu Israel jere ozi-ya nile. 43 Moses we hu ojije-ozi ahu nile, ma, le, ha ejewo ya; dika Jehova nyere iwu, otú a ka ha jere ya: Moses we gọzie ha.

Ọpupu 40

1 Jehova we gwa Moses okwu, si, 2 N'ubọchi mbu nke ọnwa mbu ka i gēguzo ebe-obibi nke ulo-ikwū nzute ahu ọtọ. 3 I gādọba kwa n'ebe ahu ib͕e ihe-àmà ahu, i gēji kwa ákwà-nb͕ochi ahu kwuchi ib͕e ahu. 4 I gēwebata kwa table ahu, do ihe ya n'usoro; i gēwe-bata kwa ihe-idọba-oriọna ahu, weli kwa oriọna-ya nile. 5 I gētiye kwa ebe-ichu-àjà ọla-edo isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'iru ib͕e ihe-àmà ahu, tukwasi kwa ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ n'ebe-obibi ahu. 6 I gētiye kwa ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku ahu n'iru ọnu-uzọ nke ebe-obibi nke ulo-ikwū nzute ahu. 7 I gētiye kwa ite ọsisa-miri ahu n'etiti ulo-ikwū nzute ahu na ebe-ichu-àjà ahu, tiye miri n'ebe ahu. 8 I gēdebe kwa ogige ahu buruburu, tiye ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ-ama ogige ahu. 9 I gēwere kwa manu otite-manu ahu te ebe-obibi ahu, na ihe nile nke di nime ya, i gēdo kwa ya nsọ, na ihe-ya nile: ọ gādi kwa nsọ. 10 I gēte kwa ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku ahu manu, ya na ihe-ya nile, do ebe-ichu-àjà ahu nsọ: ebe-ichu-àjà ahu gābu ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile. 11 I gēte kwa ite ọsisa-miri ahu na ukwu-ala-ya manu, do ya nsọ. 12 I gēme kwa Eron na umu-ya ndikom ka ha biarue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute ahu nso, i gēwere kwa miri sa ha aru. 13 I gēyikwasi kwa Eron uwe nsọ ahu; i gēte kwa ya manu, do ya nsọ, ka o we burum onye-nchu-àjà. 14 Ọ bu kwa umu-ya ndikom ka i gēme ka ha biarue nso, i gēyikwasi kwa ha uwe-ime: 15 i gēte kwa ha manu, dika i tere nna-ha, ka ha we burum ndi-nchu-àjà: otite-manu-ha aghaghi iburu ha ọlu-nchu-àjà ebighi-ebi rue ọb͕ọ-ha nile. 16 Moses we me ya: dika ihe nile si di nke Jehova nyere ya n'iwu, otú a ka ọ mere. 17 O rue n'ọnwa mbu n'arọ nke-abua, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, na eguzoro ebe-obibi ahu ọtọ. 18 Moses we guzo ebe-obibi ahu ọtọ, tiye ukwu-ya nile, guzo ibo-ya nile ọtọ, tiye nkpọrọ-ya nile, guzo ide-ya nile ọtọ. 19 Ọ we b͕asa ulo-ikwū ahu n'elu ebe-obibi ahu, tukwasi ya ihe-nkpuchi nke ulo-ikwū ahu n'elu; dika Jehova nyere Moses iwu. 20 O were ihe-àmà ahu tiye n'ib͕e ahu, tukwasi nkpa-n'aka-ya abua n'ib͕e ahu, tiyekwasi ebe-nkpuchi-nmehie n'ib͕e ahu n'elu: 21 o webata ib͕e ahu n'ebe-obibi ahu, do ákwà-nb͕ochi nke ákwà-nkwuchi ahu, we kwuchi ib͕e ihe-àmà ahu; dika Jehova nyere Moses iwu. 22 O tiye table ahu n'ulo-ikwū nzute, n'akuku ebe-obibi ahu chere iru n'Ugwu, n'èzí ákwà-nb͕ochi ahu. 23 O do usoro achicha n'usoro n'elu-ya n'iru Jehova; dika Jehova nyere Moses iwu. 24 Ọ dọba ihe-idọba-oriọna ahu nime ulo-ikwū nzute, na ncherita-iru table, n'akuku ebe-obibi ahu chere iru na Ndida. 25 O welie oriọna ahu nile n'iru Jehova; dika Jehova nyere Moses iwu. 26 O tiye ebe-ichu-àjà ọla-edo ahu n'ulo-ikwū nzute n'iru ákwà-nb͕ochi ahu: 27 o we sure n'elu ya ihe-nsure-oku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me; dika Jehova nyere Moses iwu. 28 Ọ tukwasi ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ n'ebe-obibi ahu. 29 Ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku ka ọ dọba-kwa-ra n'ọnu-uzọ ebe-obibi nke ulo-ikwū nzute, we sure n'elu ya àjà-nsure-ọku ahu na onyinye-inata-iru-ọma ahu; dika Jehova nyere Moses iwu. 30 Ọ dọba ite ọsisa-miri ahu n'etiti ulo-ikwū nzute na ebe-ichu-àjà, tiye miri n'ebe ahu, iji sa aru. 31 Moses na Eron na umu-ya ndikom we sa aka-ha na ukwu-ha site na ya: 32 mb͕e ha nābà n'ulo-ikwū nzute, na mb͕e ha nābiaru ebe-ichu-àjà nso, ha we sa aru: dika Jehova nyere Moses iwu. 33 O guzo-kwa-ra ogige ahu ọtọ buru-buru ebe-obibi ahu na ebe-ichu-àjà ahu, tiye ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ-ama ogige ahu. Moses we jesia ozi ahu. 34 Igwe-oji ahu we kpuchie ulo-ikwū nzute, ebube Jehova we juputa ebe-obibi ahu. 35 Moses apughi kwa ibà n'ulo-ikwū nzute, n'ihi na igwe-oji ahu biri n'elu ya, ebube Jehova juputa-kwa-ra ebe-obibi ahu. 36 Mb͕e ọ bula emere ka igwe-oji ahu si n'elu ebe-obibi ahu rigo, umu Israel we bulie ije, nime nbuli-ije-ha nile: 37 ma ọ buru na emeghi ka igwe-oji ahu rigo, ha adighi-ebuli kwa ije rue ubọchi emere ka ọ rigo. 38 N'ihi na igwe-oji nke Jehova di n'elu ebe-obibi ahu n'ehihie, ọku di kwa nime ya n'abali, n'anya ulo Israel nile, nime nbuli-ije-ha nile.

Levitikọs 1

1 Jehova we kpọ Moses òkù, si n'ulo-ikwū nzute gwa ya okwu, si, 2 Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e madu ọ bula n'etiti unu gēweta nso Jehova onyinye iji biaru nso, unu gēsi n'etiti anu-ulo, n'etiti ìgwè ehi na n'etiti ìgwè ewu na aturu weta nso onyinye-unu ijì biaru nso. 3 Ọ buru na onyinye-ya iji biaru nso bu àjà-nsure-ọku sitere n'ìgwè ehi, oké zuru okè ka ọ gēweta ya nso: n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute ka ọ gēweta ya nso, ka o we buru ihe nātọ utọ n'iru Jehova 4 O gēbikwasi aka-ya n'isi àjà-nsure-ọku ahu; agānara kwa ya nke-ọma n'ọnọdu ya iji kpuchiri ya nmehie-ya. 5 Ọ gēb͕u kwa nwa-ehi ahu n'iru Jehova: umu-ndikom Eron, bú ndi-nchu-àjà, gēweta ọbara-ya nso, wusa ọbara ahu n'ebe-ichu-àjà buruburu, bú nke di n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute. 6 Ọ gāb͕a kwa ehi àjà-nsure-ọku ahu akpukpọ, bọ ya n'ọbubọ-ya. 7 Umu-ndikom Eron, bú onye-nchu-àjà, gētiye ọku n'elu ebe-ichu-àjà, do nkú n'usoro n'elu ọku: 8 umu-ndikom Eron, bú ndi-nchu-àjà, gēdo anu ahu abọrọ abọ̀, na isi-ya, na abuba-ya, n'usoro n'elu nkú nke di n'elu ọku nke di n'elu ebe-ichu-àjà: 9 ma ihe-ime-ya na ọlu-ukwu na ọlu-aka-ya ka ọ gāsa miri: onye-nchu-àjà gēsuresi kwa anu ahu nile ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà, ka ọ buru àjà-nsure-ọku, bú àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova. 10 Ma ọ buru na onyinye-ya iji biaru nso sitere n'ìgwè ewu na aturu, site n'aturu, ma-ọbu site n'ewu, bú nke ọ nēweta nso ibu àjà-nsure-ọku; oké zuru okè ka ọ gēweta ya nso. 11 Ọ gēb͕u kwa ya n'iru Jehova n'akuku ebe-ichu-àjà chere iru n'Ugwu: umu-ndikom Eron, bú ndi-nchu-àjà, gāwusa ọbara-ya n'ebe-ichu-àjà buruburu. 12 Ọ gābọ kwa ya n'ọbubọ-ya nile, ya na isi-ya na abuba-ya: onye-nchu-àjà gēdo kwa ha n'usoro n'elu nkú nke di n'elu ọku nke di n'elu ebe-ichu-àjà: 13 ma ihe-ime-ya na ọlu-ukwu na ọlu-aka-ya ka ọ gāsa miri: onye-nchu-àjà gēweta anu ahu nile nso, sure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà; àjà-nsure-ọku ka ọ bu, àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova. 14 Ma ọ buru na onyinye-ya iji biaru nso Jehova bu àjà-nsure-ọku sitere n'anu-ufe, o gēsi n'etiti nduru ma-ọbu n'etiti umu-kpalakwukwu weta nso onyinye-ya iji biaru nso. 15 Onye-nchu-àjà gēweta ya nso ebe-ichu-aja, gbupu isi ya, sure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà; agāpipu kwa ọbara-ya n'akuku ebe-ichu-àjà: 16 ọ gēwezuga kwa àkpà-nri-ya na ihe di nime ya, tufu na nso ebe-ichu-àjà n'akuku Iru-anyanwu, n'ebe ntú: 17 ọ gāb͕ọwa kwa ya na nkù-ya abua, ma ọ gaghi-ekewa ya: onye-nchu-àjà gēsure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-aja, n'elu nkú nke di n'elu ọku: àjà-nsure-ọku ka ọ bu, àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova.

Levitikọs 2

1 Ma mb͕e madu gēweta nso onyinye-ya iji biaru nso, bú onyinye anēnye Jehova inata iru-ọma, utu ọka flour ka onyinye-ya iji biaru nso gābu; ọ gāwukwasi ya manu, tiye kwa frankincense n'elu ya: 2 ọ gēweta-kwa-ra umu-ndikom Eron ya, bú ndi-nchu-àjà: o gēsi nime ya weju nweju-aka-ya sitere n'utu ọka flour-ya, site kwa na manu-ya, tiyere frankincense nke ya nile; onye-nchu-àjà gēsure kwa ihe-ncheta-ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà, ọ bu àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova: 3 ma nke fọduru site n'onyinye-inata-iru-ọma ahu bu ihe Eron na umu-ya ndikom gēnwe: ọ bu ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile sitere n'àjà-ọku nile anāchuru Jehova. 4 Ma mb͕e i gēweta nso onyinye iji biaru nso, bú onyinye-inata-iru-ọma esiri n'ite-ọku, ọ gābu ob͕e achicha ekoghi-eko nke utu ọka flour agwara manu, ma-ọbu mbadamba-achicha ekoghi-eko nke etere manu. 5 Ma ọ buru na onyinye-gi iji biaru nso bu onyinye-inata-iru-ọma eghere n'ite eji eghe ihe, utu ọka flour agwara manu, nke nēkoghi eko, ka ọ gābu. 6 Nyawa ya na nnyawa-ya nile, wukwasi ya manu: onyinye-inata-iru-ọma ka ọ bu. 7 Ma ọ buru na onyinye-gi iji biaru nso bu onyinye-inata-iru-ọma eghere n'ihe ighe ihe, utu ọka flour etiyere manu ka agēji me ya. 8 I gēweta-kwa-ra Jehova onyinye-inata-iru-ọma nke eji ihe ndia me: agēweta kwa ya nso onye-nchu-àjà, ọ gēweta kwa ya n'ebe-ichu-àjà. 9 Onye-nchu-àjà gēsi kwa n'onyinye-inata-iru-ọma ahu bulie ihe-ncheta-ya, sure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà: ọ bu àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova. 10 Ma nke fọduru site n'onyinye-inata-iru-ọma ahu Bu ihe Eron na umu-ya ndikom gēnwe: ọbu ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile sitere n'àjà-ọku nile anāchuru Jehova. 11 Ọ dighi onyinye-inata-iru-ọma ọ bula nke unu gēweta nso Jehova agēji ihe nēko achicha me: n'ihi na ọ dighi ihe ọ bula nke nēko achicha, ma-ọbu manu-aṅu ọ bula, unu gēji sure ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ka ọ buru àjà-ọku anāchuru Jehova. 12 Dika onyinye iji biaru nso, bú nkpuru mbu, ka unu gēweta ha nso Jehova: ma n'elu ebe-ichu-àjà ka ha nāgaghi-arigo, ibu ihe ísì utọ. 13 Onyinye ọ bula iji biaru nso nke onyinye-inata-iru-ọma-gi, i gēye kwa ya nnú; eme-kwa-la ka nnú nke ọgbugba-ndu Chineke-gi ghara idi n'onyinye-inata-iru-ọma-gi: n'onyinye-gi nile iji biaru nso ka i gēweta nnú nso. 14 Ma ọ buru na i weta nso onyinye-inata-iru-ọma, bú nkpuru mbu, inye Jehova, ọka rara oko aṅara n'ọku, ọka nke ubi ọma esuru esu, ka i gēweta nso, ka ọ buru onyinye-inata-iru-ọma sitere na nkpuru mbu i. 15 I gētiye manu n'elu ya, tukwasi ya frankincense: onyinye-inata-iru-ọma ka ọ bu. 16 Onye-nchu-àjà gēsure ihe-ncheta-ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ, bú ufọdu nime ọka-ya esuru esu, na ufọdu nime manu-ya, tiyere frankincense-ya nile: ọ bu àjà-ọku anāchuru Jehova.

Levitikọs 3

1 Ma ọ buru na onyinye-ya iji biaru nso bu ihe àjà nke àjà-udo; ọ buru na ọ bu ihe si n'ìgwè ehi puta ka ya onwe-ya nēweta nso, ma ọ bu oké ma-ọbu nwunye, n'izu-okè ka ọ gēweta ya nso n'iru Jehova. 2 O gēbikwasi aka-ya n'isi onyinye-ya iji biaru nso, b͕u kwa ya n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute: umu-ndikom Eron, bú ndi-nchu-àjà, gāwusa ọbara-ya n'ebe-ichu-àjà buruburu. 3 O gēsi kwa n'ihe àjà nke àjà-udo weta nso àjà-ọku ichuru Jehova; bú abuba nke nēkpuchi ihe-ime, na abuba nile nke di n'elu ihe-ime, 4 na akọrọ abua, na abuba nke di n'elu ha, nke di n'akuku ákwù-ya, na mba-imeju nke di n'imeju, (n'akuku akọrọ ka ọ gēwuzuga ya). 5 Umu-ndikom Eron gēsure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà n'elu àjà-nsure-ọku, nke di n'elu nkú nke di n'elu ọku: ọ bu àjà-ọku nke ihe ísì utọ anēsurere Jehova. 6 Ma ọ buru na onyinye-ya iji biaru nso, nke, ọ nēnye ka ọ buru ihe àjà nke àjà-udo ichuru Jehova, esi n'ìgwè ewu na aturu puta; oké ma-ọbu nwunye, n'izu-okè ka ọ gēweta ya nso. 7 Ọ buru na ọ bu aturu ka ya onwe-ya nēweta nso ibu onyinye-ya iji biaru nso, ọ gēweta kwa ya nso n'iru Jehova: 8 ọ gēbikwasi aka-ya n'isi onyinye-ya iji biaru nso, b͕u kwa ya n'iru ulo-ikwū nzute: umu-ndikom Eron gāwusa ọbara-ya n'ebe-ichu-àjà buruburu. 9 O gēsi kwa n'ihe àjà nke àjà-udo weta nso àjà-ọku ichuru Jehova: bú abuba-ya, na akuku ọdudu-ya nwere abuba n'izu-okè-ya, (n'ebe ọkpukpu-azu-ya di ka ọ gēwezuga ya); na abuba nke nēkpuchi ihe-ime, na abuba nile nke di n'elu ihe-ime, 10 na akọrọ abua, na abuba nke di n'elu ha, nke di n'akuku úkwù, na mba-imeju nke di n'imeju, (n'akuku akọrọ ka ọ gēwezuga ya). 11 Onye-nchu-àjà gēsure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà: ọ bu nri àjà-ọku anāchuru Jehova. 12 Ma ọ buru na onyinye-ya iji biaru nso bu ewu, ọ gēweta kwa ya nso n'iru Jehova. 13 O gēbikwasi aka-ya n'isi-ya, b͕u kwa ya n'iru ulo-ikwū nzute: umu-ndikom Eron gāwusa ọbara-ya n'ebe-ichu-àjà buruburu. 14 O gēsi kwa nime ya weta nso onyinye-ya iji biaru nso, bú àjà-ọku ichuru Jehova; abuba nke nēkpuchi ihe-ime, na abuba nile nke di n'elu ihe-ime, 15 na akọrọ abua, na abuba nke di n'elu ha, nke di n'akuku úkwù, na mba-imeju nke di n'imeju, (n'akuku akọrọ ka ọ gēwezuga ya). 16 Onye-nchu-àjà gēsure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà: ọ bu nri àjà-ọku, ka ọ buru ihe ísì utọ: abuba nile bu ihe Jehova nwere. 17 Ọ gābu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile n'ebe-obibi-unu nile, na unu agaghi-eri abuba ọ bula ma-ọbu ọbara ọ bula.

Levitikọs 4

1 Jehova we gwa Moses okwu, si, 2 Gwa umu Israel okwu, si, Mb͕e madu gēmehie n'amaghi-ama megide ihe ọ bula nime ihe Jehova nyere n'iwu, si, Emela ha; ọ we me otù nime ha: 3 ọ buru na onye-nchu-àjà etere manu emehie dika ikpe-ọmuma ndim si di; ọ gēweta kwa nso nwa-oke-ehi zuru okè bayere nmehie-ya, nke o mehieworo, ichuru Jehova, ka ọ buru àjà-nmehie. 4 Ọ gēme ka oke-ehi ahu biarute ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute n'iru Jehova; ọ gēbikwasi aka-ya n'isi oke-ehi ahu, b͕u kwa oké-ehi ahu n'iru Jehova. 5 Onye-nchu-àjà etere manu gēwere ufọdu nime ọbara oké-ehi, webata ya n'ulo-ikwū nzute: 6 onye-nchu-àjà ahu gēdeye nkpisi-aka-ya n'ọbara ahu, fesa ufọdu nime ọbara ahu ub͕ò asa n'iru Jehova, n'iru ákwà-nb͕ochi nke ebe nsọ ahu. 7 Onye-nchu-àjà gēwere kwa ufọdu nime ọbara ahu tiye n'elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me n'iru Jehova, nke di nime ulo-ikwū nzute; ọ bu kwa ọbara nile nke oke-ehi ahu ka ọ gāwusi na ntọ-ala ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku, nke di n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute. 8 Ọ gēsi kwa nime ya welie abuba nile nke oke-ehi nke àjà-nmehie; bú abuba nke nēkpuchi ihe-ime, na abuba nile nke di n'elu ihe-ime, 9 na akọrọ abua, na abuba nke di n'elu ha, nke di n'akuku úkwù, na mba-imeju nke di n'imeju, (n'akuku akọrọ ka ọ gēwezuga ya), 10 dika esi n'oké-ehi nke ihe àjà nke àjà-udo eweli ya: onye-nchu-àjà gēsure kwa ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku. 11 Ma akpukpọ oke-ehi ahu, na anu-ya nile, tiyere isi-ya, tiye kwa ọlu-ukwu-ya na ọlu-aka-ya, na ihe-ime-ya, na nsi-ya, 12 ọbuná oke-ehi ahu nile ka o gēbupu je n'azu ọmuma-ulo-ikwū rue ebe di ọcha, rue ikpo-ntu, sure ya n'elu nkú n'ọku: n'elu ikpo-ntu ka agēsure ya ọku. 13 Ma ọ buru na nzukọ nile nke Israel eme ihe n'amaghi-ama, ewe zopu ihe ahu n'anya nkpọkọta Israel, ọ buru kwa na ha emewo ihe megide otù nime ihe nile Jehova nyere n'iwu bayere ihe anāgaghi-eme, ikpe ewe ma ha; 14 mb͕e amara nmehie nke ha mehieworo nime ya, nkpọkọta Israel ahu gēweta kwa nso nwa-oke-ehi ibu àjà-nmehie, ha gēme kwa ka ọ bia n'iru ulo-ikwū nzute. 15 Ndi-okenye nzukọ ahu gēbikwasi aka-ha n'isi oke-ehi ahu n'iru Jehova: agēb͕u kwa oke-ehi ahu n'iru Jehova. 16 Onye-nchu-aja etere manu gēwebata ufọdu nime ọbara oke-ehi ahu n'ulo-ikwū nzute: 17 onye-nchu-aja gēdeye nkpisi-aka-ya nime ọbara ahu, fesa ya ub͕ò asa n'iru Jehova, n'iru akwa-nb͕ochi ahu. 18 Ọ gēwere kwa ufọdu nime ọbara ahu tiye n'elu mpi nile nke ebe-ichu-aja nke di n'iru Jehova, nke di nime-ulo-ikwū nzute, ọ bu kwa ọbara nile ka ọ gāwusi na ntọ-ala ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku, nke di n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute. 19 O gēsi kwa nime ya welie abuba-ya nile, sure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-aja. 20 Ọ gēme kwa oke-ehi ahu dika ọ mere oke-ehi nke àjà-nmehie, otú a ka ọ gēme ya: onye-nchu-aja gēkpuchi-kwa-ra ha nmehie-ha, agāb͕aghara kwa ha ya. 21 O gēbupu kwa oke-ehi ahu je n'azu ọmuma-ulo-ikwū, sure ya ọku dika o surere oke-ehi mbu: àjà-nmehie nke nkpọkọta Israel ka ọ bu. 22 Mb͕e onye-isi nēmehie, me kwa ihe n'amaghi-ama megide otù nime ihe nile Jehova nyere n'iwu bayere ihe anāgaghi-eme, ikpe ewe ma ya; 23 ọ buru kwa na eme ka ọ mara nmehie-ya nke ọ mehieworo nime ya, ọ gēweta nkpi, bú oké zuru okè, ka ọ buru onyinye-ya iji biaru nso; 24 o gēbikwasi aka-ya n'isi nkpi ahu, b͕u kwa ya n'ebe anēb͕u anu àjà-nsure-ọku n'iru Jehova: àjà-nmehie ka ọ bu. 25 Onye-nchu-aja gēwere kwa ufọdu nime ọbara nke àjà-nmehie na nkpisi-aka-ya, tiye ya n'elu mpi nile nke ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku, ọbara-ya ka ọ gāwusi kwa na ntọ-ala ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku. 26 Abuba-ya nile ka o gēsure ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-aja, dika abuba ihe àjà nke àjà-udo: onye-nchu-aja gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya, agāb͕aghara kwa ya ya. 27 Ma ọ buru na otù madu n'etiti ndi ala emehie n'amaghi-ama, n'ime ihe megide otù nime ihe Jehova nyere n'iwu bayere ihe anāgaghi-eme, ikpe ewe ma ya; 28 ọ buru kwa na eme ka ọ mara nmehie-ya nke ọ mehieworo, ọ gēweta kwa ewu, bú nne zuru okè, bayere nmehie-ya nke ọ mehieworo, ka ọ buru onyinye-ya iji biaru nso. 29 Ọ gēbi-kwasi aka-ya n'isi ihe àjà-nmehie ahu, b͕u kwa ihe àjà-nmehie ahu n'ebe àjà-nsure-ọku. 30 Onye-nchu-àjà gēwere ufọdu nime ọbara-ya na nkpisi-aka-ya, tiye ya n'elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku, ọ bu kwa ọbara-ya nile ka ọ gāwusi na ntọ-ala ebe-ichu-àjà. 31 Abuba-ya nile ka ọ gēwezuga, dika ewezugara abuba n'elu ihe àjà nke àjà-udo; onye-nchu-àjà gēsure kwa ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà, ka ọ buru ihe ísì utọ anēsurere Jehova; onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya, agāb͕aghara kwa ya ya. 32 Ma ọ buru na ọ weta nwa-aturu dika onyinye-ya iji biaru nso ka ọ buru àjà-nmchie, nne zuru okè ka ọ gēweta ya. 33 O gēbikwasi aka-ya n'isi ihe àjà-nmehie ahu, b͕u kwa ya ibu àjà-nmehie n'ebe ha nēb͕u ihe àjà-nsure-ọku. 34 Onye-nchu-àjà gēwere ufọdu nime ọbara àjà-nmehie ahu na nkpisi-aka-ya, tiye ya n'elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku, ọ bu kwa ọbara-ya nile ka ọ gāwusi na ntọ-ala ebe-ichu-àjà: 35 abuba-ya nile ka ọ gēwezuga, dika anēwezuga abuba nwa-aturu n'ihe àjà nke àjà-udo: onye-nchu-àjà gēsure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà, n'elu àjà-ọku nke Jehova: onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya nke ọ mehieworo, agāb͕aghara kwa ya ya.

Levitikọs 5

1 Mb͕e madu gēmehie, site n'inu olu ọb͕ub͕a-iyi, mb͕e ya onwe-ya bu onye-àmà, ma ọ bu na ọ huwo ma-ọbu na ọ mawo, ọ buru na o gosighi ya, o gēbu kwa ajọ omume-ya: 2 ma-ọbu mb͕e madu gēmetu ihe ọ bula ruru árú aru, ma ọ bu ozu anu-ọhia ruru árú, ma-ọbu ozu anu-ulo ruru árú, ma-ọbu ozu ihe nēnuputa enuputa nke ruru árú, ma ezonariri ya ya, ya onwe-ya ewe ru kwa árú, ikpe gāma kwa ya: 3 ma-ọbu mb͕e ọ gēmetu ihe ruru árú nke madu, ọbuná ihe ọ bula nke ya ruru árú nke eji meru ya, ma ezonariri ya ya; mb͕e ya onwe-ya mara, ikpe gāma kwa ya: 4 ma-ọbu mb͕e madu gāṅu iyi, nēwere eb͕ub͕ere-ọnu-ya kwu okwu efu ime ihe ọjọ, ma-ọbu ime ezi ihe, ọbuná okwu efu ọ bula madu nēkwu n'iṅu iyi, ma ezonariri ya; mb͕e ya onwe-ya mara, ikpe gāma kwa ya bayere otù nime ihe ndia: 5 o gēru kwa, mb͕e ikpe mara ya bayere otù nime ihe ndia, na o gēkwuputa ihe ahu nke ọ mehieworo nmehie bayere ya: 6 ọ gēweta-kwa-ra Jehova àjà-ikpe-ọmuma-ya bayere nmehie-ya nke ọ mehieworo, bú nne nke si n'ìgwè ewu na aturu puta, nwa-aturu ma-ọbu nwa-ewu, ka ọ buru àjà-nmehie; onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya ahu. 7 Ma ọ buru na aka-ya erughi ihe gēzù nwa-aturu, o gēweta-kwa-ra Jehova àjà-ikpe-ọmuma-ya bayere nmehie nke ọ mehieworo, bú nduru abua ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua; otù ka ọ buru àjà-nmehie, ibe-ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku. 8 Ọ gāchitara ha onye-nchu-àjà, onye-nchu-àjà gēburu uzọ weta nso nke diri àjà-nmehie, ọ gātubipu isi-ya site n'olu-ya, ma ọ gaghi-ekewa ya. 9 Ọ gēfesa ufọdu nime ọbara àjà-nmehie ahu n'elu akuku ebe-ichu-àjà; ma nke fọduru nime ọbara ka agāgbasa na ntọ-ala ebe-ichu-aja: àjà-nmehie ka ọ bu. 10 Ọ gēme nke-abua ka ọ buru àjà-nsure-ọku dika ikpé ahu si di: onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya ahu nke ọ mehieworo, agāb͕aghara kwa ya ya. 11 Ma ọ buru na aka-ya erughi na nduru abua ma-ọbu n'umu-kpalakwu-kwu abua, ọ gēweta kwa onyinye-ya iji biaru nso, bayere nmehie nke ọ mehie-woro, bú otù uzọ n'uzọ iri nke ephah utu ọka flour ka ọ buru àjà-nmehie; ọ gaghi-atukwasi ya manu, ọ gaghi-etiye kwa frankincense n'elu ya: n'ihi na àjà-nmehie ka ọ bu. 12 Ọ gēweta-kwa-ra ya onye-nchu-àjà, onye-nchu-àjà gēweju kwa nweju-aka-ya site na ya ibu ihe-ncheta-ya, o gēsure kwa ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà, n'elu àjà-ọku nke Jehova: àjà-nmehie ka ọ bu. 13 Onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya ahu nke ọ mehieworo n'otù nime ihe ndia, agāb͕aghara kwa ya ya: ma nke fọduru gābu ihe onye-nchu-àjà nwere, dika onyinye-inata-iru-ọma ahu. 14 Jehova we gwa Moses okwu, si, 15 Mb͕e madu gēmekpu ihe-nmekpu, mehie n'amaghi-ama megide ihe nsọ nile nke Jehova; ọ gēweta-kwa-ra Jehova àjà-ikpe-ọmuma-ya, bú ebulu zuru okè si n'ìgwè ewu na aturu puta, dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di n'ọla-ọcha shekel, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di, ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma: 16 ma ihe nke ọ mehieworo megide ihe nsọ ahu, ọ gākwughachi ya, ọ gātukwasi kwa otù uzọ n'uzọ ise n'elu ya, nye ya onye-nchu-àjà: onye-nchu-àjà gēwere ebulu àjà-ikpe-ọmuma kpuchiere ya nmehie-ya, agāb͕aghara kwa ya ya. 17 Ma ọ buru si na madu emehie, me ihe megide otù nime ihe nile Jehova nyere n'iwu bayere ihe anāgaghi-eme; ọ bu ezie na ọ maghi, ma ikpe mara ya, o gēbu kwa ajọ omume-ya. 18 Ọ gēweta-kwa-ra onye-nchu-àjà ebulu zuru okè si n'ìgwè ewu na aturu puta, dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di, ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma: onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie bayere ihe ọ mere n'amaghi-ama, ma ya onwe-ya amaghi ya, agāb͕aghara kwa ya ya. 19 Àjà-ikpe-ọmuma ka ọ bu: ikpe mara ya n'ezie n'iru Jehova.

Levitikọs 6

1 Jehova we gwa Moses okwu, si, 2 Mb͕e madu gēmehie, mekpu ihe-nmekpu megide Jehova, ghọb͕u madu-ibe-ya n'ihe-ndebe, ma-ọbu n'ihe etiyere n'aka-ya, ma-ọbu n'ihe anapuru madu n'ike, ma-ọbu mb͕e ọ meb͕uworo madu-ibe-ya; 3 ma-ọbu mb͕e ọ hutaworo ihe furu efu, o we ghọ aghughọ nime ya, ṅu iyi n'ugha; n'otù nime ihe ndia nile nke madu nēme, nēmehie nime ha: 4 o gēru kwa, mb͕e ọ gēmehie, mb͕e ikpe mara ya, na ọ gēnyeghachi ihe ọ napuru madu n'ike, ma-ọbu ihe ọ nwetara na nmeb͕u, ma-ọbu ihe-ndebe enyere ya idebe, ma-ọbu ihe furu efu nke ọ huta-woro, 5 ma-ọbu ihe ọ bula nke ọ ṅuru iyi bayere ya n'ugha; o gākwughachi kwa ya na nkwuzu-ya, ọ bu kwa otù uzọ n'uzọ ise ka ọ gātukwasi ya: ọ bu onye nwe ihe ahu ka ọ gēnye ya, n'ubọchi àjà-ikpe-ọmuma-ya. 6 Ọ gēweta-kwa-ra Jehova àjà-ikpe-ọmuma-ya, bú ebulu zuru okè sitere n'ìgwè ewu na aturu, dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di, ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma, ọ gēwetara onye-nchu-àjà: 7 onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya n'iru Jehova, agāb͕aghara kwa ya ya; bayere ihe ọ bula nime ihe nile nke ọ nēme, nke ikpe mara ya nime ya. 8 Jehova we gwa Moses okwu, si, 9 Nye Eron na umu-ya ndikom iwu, si, Nka bu iwu nke àjà-nsure-ọku: nke ahu bu àjà-nsure ọku bayere orire-ọku n'elu ebe-ichu-àjà ogologo abali nile rue ututu, agēme kwa ka ọku ebe-ichu-àjà nēre ere n'elu ya. 10 Onye-nchu-àjà gēyiri kwa uwe-nwuda ákwà ọcha ya, uwe-ukwu ákwà ọcha ya ka o gēyikwasi kwa n'anu-aru-ya; ọ gāchili kwa ntu ahu nke ọku gērechaputa n'àjà-nsure-ọku n'elu ebe-ichu-àjà, dọba ha na nso ebe-ichu-àjà. 11 O gēyipu uwe-ya, yiri uwe ọzọ, bupu ntu ahu je n'azu ọmuma-ulo-ikwū, rue ebe di ọcha. 12 Agēme kwa ka ọku nke di n'elu ebe-ichu-àjà nēre ere n'elu ya, ọ gaghi-anyu anyu; onye-nchu-àjà gēsure nkú ọku n'elu ya kwa-ututu: o gēdo kwa àjà-nsure-ọku n'usoro n'elu ya, sure kwa abuba nke àjà-udo nile ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ya. 13 Mb͕e dum ka agēme ka ọku nēre ere n'elu ebe-ichu-àjà; ọ gaghi-anyu anyu. 14 Nka bu kwa iwu onyinye-inata-iru-ọma: umu-ndikom Eron gēweta ya nso n'iru Jehova, n'iru ebe-ichu-àjà. 15 O gēsite nime ya weju nweju-aka-ya weli, bú site n'utu ọka flour nke onyinye-inata-iru-ọma, site kwa na manu-ya, weli kwa frankincense nile nke di n'elu onyinye-inata-iru-ọma ahu, o gēsure kwa ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà ka ọ buru ihe ísì utọ, dika ihe-ncheta-ya, anēsurere Jehova. 16 Ma ihe fọduru nime ya, Eron na umu-ya ndikom gēri ya: nēkoghi eko ka agēri ya n'ebe di nsọ; n'ogige ulo-ikwū nzute ka ha gēri ya. 17 Agaghēwere ihe nēko achicha sie ya. Enyewom ya ka ọ buru òkè-ha sitere n'àjà-ọkum nile; ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu, dika àjà-nmehie, na dika àjà-ikpe-ọmuma. 18 Nwoke ọ bula n'etiti umu Eron gēri ya, dika ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile, site n'àjà-ọku nke Jehova: onye ọ bula nke nēmetu ha aru gādi nsọ. 19 Jehova we gwa Moses okwu, si, 20 Nka bu onyinye iji biaru nso nke Eron na umu-ya ndikom, nke ha gēwetara Jehova nso n'ubọchi etere ya manu; otù uzọ n'uzọ iri nke ephah utu ọka flour ibu onyinye-inata-iru-ọma mb͕e dum, nkera-ya n'ututu, nkera-ya kwa n'anyasi. 21 N'ite isi ihe ka agēwere manu me ya; mb͕e ọ deworo edè i gēwebata ya: iberibe achicha esiri esi nke onyinye-inata-iru-ọma ka i gēweta nso ibu ihe ísì utọ anēsurere Jehova. 22 Onye-nchu-aja etere manu nke gānọchi ya site n'umu-ya ndikom gēme ya: ọ bu ukpuru ebighi-ebi Jehova nwere; agēsuresi ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ. 23 Onyinye-inata-iru-ọma ọ bula nke onye-nchu-àjà ka agēsuresi kwa oku: agaghi-eri ya. 24 Jehova we gwa Moses okwu, si, 25 Gwa Eron, gwa kwa umu-ya ndikom, okwu, si, Nka bu iwu àjà-nmehie: n'ebe anēb͕u ihe àjà-nsure-ọku ka agēb͕u ihe àjà-nmehie n'iru Jehova: ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu. 26 Onye-nchu-àjà nke nāchu ya bayere nmehie gēri ya; n'ebe di nsọ ka agēri ya, n'ogige ulo ikwū nzute. 27 Ihe ọ bula nke nēmetu anu-ya aru gādi nsọ: mb͕e efesara ufọdu nime ọbara-ya n'uwe ọ bula, i gāsu kwa ihe ahu efesara ya n'elu ya n'ebe di nsọ. 28 Ma agētiwa ihe ájá nke esiri ya nime ya: ma ọ buru na n'ihe ọla ka esiri ya, agēchicha ya, ṅacha ya na miri. 29 Nwoke ọ bula n'etiti ndi-nchu-àjà gēri ya: ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu. 30 Ọ dighi kwa àjà-nmehie ọ bula agēri, bú nke anēwebata ufọdu nime ọbara-ya n'ulo-ikwū nzute ikpuchi nmehie n'ebe nsọ ahu: agēwere ọku sure ya.

Levitikọs 7

1 Nka bu kwa iwu àjà-ikpe-ọmuma: ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu. 2 N'ebe ha nēb͕u ihe àjà-nsure-ọku ka ha gēb͕u ihe àjà-ikpe-ọmuma; ọ gāwusa kwa ọbara-ya n'ebe-ichu-àjà buruburu. 3 Abuba-ya nile ka ọ gēsi nime ya weta nso; bú akuku ọdudu-ya nwere abuba, na abuba nke nēkpuchi ihe-ime, 4 na akọrọ abua, na abuba nke di n'elu ha, nke di n'akuku úkwù, na mba-imeju nke di n'imeju, (n'akuku akọrọ ka ọ gēwezuga ya): 5 onye-nchu-àjà gēsure ha ọku ibu ihe nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà ka ọ buru àjà-ọku anāchuru Jehova: àjà-ikpe-ọmuma ka ọ bu. 6 Nwoke ọ bula n'etiti ndi-nchu-àjà gēri ya: n'ebe di nsọ ka agēri ya: ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu. 7 Dika àjà-nmehie si di, otú a ka àjà-ikpe-ọmuma di: otù iwu diri ha: onye-nchu-àjà nke nēwere ya ikpuchi nmehie, ya onwe-ya gēnwe ya. 8 Onye-nchu-àjà nke nēweta nso àjà-nsure-ọku nke onye ọ bula, onye-nchu-àjà onwe-ya gēnwe akpukpọ nke ihe àjà-nsure-ọku nke o wetaworo nso n'onwe-ya. 9 Ọzọ, onyinye-inata-iru-ọma ọ bula nke anēsi n'ite-ọku, na ihe ọ bula anēme n'ihe ighe ihe, na n'ite isi ihe, onye-nchu-àjà nke nēweta ya nso, ya onwe-ya gēnwe ya. 10 Ọzọ onyinye-inata-iru-ọma ọ bula, agwara manu, ma-ọbu nke kpọrọ akpọ, umu-ndikom Eron nile gēnwe ya, otù dika ibe-ya. 11 Nka bu kwa iwu nke ihe àjà nke àjà-udo nke madu gēweta nso Jehova. 12 Ọ buru na ọ weta ya nso ka ọ buru àjà-ekele, ọ gēweta kwa nso ob͕e achicha ekoghi-eko ufọdu nke agwara manu, na mbadamba-achicha ekoghi-eko ufọdu nke etere manu, na ob͕e achicha ufọdu agwara manu, nke utu ọka flour dere edè, tiyere àjà-ekele ahu. 13 N'elu ob͕e achicha koro eko ufọdu ka ọ gēweta nso onyinye-ya iji biaru nso tiyere àjà-ekele nke àjà-udo-ya. 14 O gēsi kwa na ya weta nso otù nime onyinye ọ bula iji biaru nso ka ọ buru àjà-nbuli ibuliri Jehova; onye-nchu-aja nke nāwusa ọbara àjà-udo, ya onwe-ya gēnwe ya. 15 Agēri kwa anu nke àjà-ekele nke àjà-udo-ya n'ubọchi nke onyinye-ya iji biaru nso; ọ gaghi-adọba ufọdu nime ya rue ututu. 16 Ma ọ buru na àjà nke onyinye-ya iji biaru nso bu nkwa ma-ọbu àjà-afọ-ofufo, n'ubọchi ọ nēweta nso àjà-ya-ka agēri ya: n'echi-ya ka agēri kwa nke fọduru nime ya: 17 ma nke fọduru nime anu nke àjà ahu, agēji ọku sure ya n'ubọchi nke-atọ. 18 Ma ọ buru na erie ufọdu nime anu nke ihe àjà nke àjà-udo-ya n'ubọchi nke-atọ n'uzọ ọ bula, ọ gaghi-atọ utọ: onye nēweta ya nso, agaghi-agu ya nye ya: ihe-árú ka ọ gābu, madu nke nēri ufọdu nime ya gēbu kwa ajọ omume-ya. 19 Anu nke meturu ihe ọ bula ruru árú, agaghi-eri ya: agēji ọku sure ya. Ma anu àjà ahu, onye ọ bula nke di ọcha gēri anu-ya: 20 ma madu nke nēri anu sitere n'ihe àjà nke-udo, nke Jehova nwere, ma ọrurú-ya di n'aru ya, agēbipu madu ahu n'etiti umu-nna-ya. 21 Ma mb͕e madu gēmetu ihe ọ bula ruru árú aru, bú ọrurú madu, ma-ọbu anumanu ruru árú, maọbu ihe-árú ọ bula ruru árú, we rie ufọdu nime anu ihe àjà-udo, nke Jehova nwere, agēbipu madu ahu n'etiti umu-nna-ya. 22 Jehova we gwa Moses okwu, si, 23 Gwa umu Israel okwu, si, Unu erila abuba ọ bula, nke ehi, ma-ọbu aturu, ma-ọbu ewu. 24 Abuba nke anumanu nwuru onwe-ya, na abuba nke anumanu anu-ọhia dọb͕uru, agēdozi ya iji je ozi ọ bula: ma unu erila ya ma-ọli. 25 N'ihi na onye ọ bula nke nēri abuba sitere n'anumanu nke madu si nime ya eweta nso àjà-ọku ichuru Jehova, agēbipu kwa madu nke nēri ya n'etiti umu-nna-ya. 26 Ọ dighi kwa ọbara ọ bula unu gēri n'ebe-ọbibi-unu nile, nke anu-ufe, ma ọbu nke anumanu. 27 Madu ọ bula nke gēri ọbara ọ bula, agēbipu kwa madu ahu n'etiti umu-nna-ya. 28 Jehova we gwa Moses okwu, si, 29 Gwa umu Israel okwu, si, Onye nēwetara Jehova nso ihe àjà nke àjà-udo-ya gēsi n'ihe àjà nke àjà-udo-ya wetara Jehova onyinye-ya iji biaru nso: 30 aka ya gēweta àjà-ọku nke Jehova; abuba di n'akuku okpukpu-obi ka ọ gēweta, ya na okpukpu-obi, ifé ya ka ọ buru àjà-ofufé n'iru Jehova. 31 Onye-nchu-àjà gēsure kwa abuba ahu ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísi utọ n'ebe-ichu-àjà: ma okpukpu-obi ahu ka Eron na umu-ya ndikom gēnwe. 32 Utaku-ukwu aka-nri ka unu gēnye kwa onye-nchu-àjà ibu àjà-nbuli sitere n'ihe àjà nile nke àjà-udo-unu. 33 Onye ahu n'etiti umu-ndikom Eron nke nēweta nso ọbara nke àjà-udo nile, na abuba-ha, ya gēnwe utaku-ukwu aka-nri ahu ka ọ buru òkè-ya. 34 N'ihi na okpukpu-obi nke àjà-ofufé na utaku-ukwu nke àjà-nbuli ka M'naraworo n'aka umu Israel site n'ihe àjà nile nke àjà-udo-ha nile, nye Eron, bú onye-nchu-àjà, nye kwa umu-ya ndikom, n'ukpuru ebighi-ebi, sitere n'aka umu Israel. 35 Nka bu òkè otite-manu Eron, na òkè otite-manu umu-ya ndikom, sitere n'àjà-ọku nke Jehova, n'ubọchi O mere ka ha biarue nso iburu Jehova ndi-nchu-àjà; 36 bú nke Jehova nyere iwu ka enye ha site n'aka umu Israel, n'ubọchi O tere ha manu. Ọ bu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-ha nile. 37 Nka bu iwu diri àjà-nsure-ọku, di-kwa-ra onyinye-inata-iru-ọma, di-kwa-ra àjà-nmehie, di-kwa-ra àjà-ikpe-ọmuma, di-kwa-ra nmeju-aka, di-kwa-ra ihe àjà nke àjà-udo; 38 nke Jehova nyere Moses n'iwu n'ugwu Sainai, n'ubọchi O nyere umu Israel iwu iwetara Jehova nso onyinye-ha iji biaru nso, n'ọzara Sainai.

Levitikọs 8

1 Jehova we gwa Moses okwu, si, 2 Chiri Eron na umu-ya ndikom tiyere ya, na uwe-ha, na manu otite-manu ahu, na oke-ehi nke àjà-nmehie, na ebulu abua ahu, na nkata achicha ekoghi-eko; 3 kpọkọta kwa nzukọ Israel nile n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute. 4 Moses we me dika Jehova nyere ya iwu; ewe kpọkọta nzukọ ahu n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute. 5 Moses we si nzukọ ahu, Nka bu ihe Jehova nyere n'iwu ka eme ya. 6 Moses we me ka Eron na umu-ya ndikom biaru nso, o were kwa miri sa ha aru. 7 O tiye n'aru ya uwe-ime ahu, were ihe ike n'úkwù ke ya, yikwasi ya uwe-nwuda, tiye ephod n'aru ya, ke ya n'ihe-ọkiké ephod nke onye-ọ̀kà kpara, were ya kegide ephod ahu n'aru ya. 8 Ọ tukwasi n'aru ya ihe-ib͕ochi-obi; tiye kwa n'elu ihe-ib͕ochi-obi Ìhè ahu na Izu-okè ahu. 9 Ọ tukwasi ákwà-nkukù-isi n'isi-ya; tukwasi kwa n'ákwà-nkukù-isi ahu, n'iru ya, ihe ahu di mbara nke ọla-edo, bú okpu nsọ nke onye-nchu-àjà; dika Jehova nyere Moses iwu. 10 Moses we were manu otite-manu ahu, te ebe-obibi ahu na ihe nile nke di nime ya, do ha nsọ. 11 Ọ we fesa ufọdu nime ya n'ebe-ichu-àjà ub͕ò asa, te kwa ebe-ichu-àjà na ihe-ya nile, na ite ọsisa-miri na ukwu-ala-ya, manu, ido ya nsọ. 12 Ọ wukwasi kwa ufọdu nime manu otite-manu ahu n'isi Eron, te kwa ya manu, ido ya nsọ. 13 Moses we me ka umu-ndikom Eron biaru nso, o yikwasi ha uwe-ime, were ihe ike n'úkwù ke ha, ke kwa ha ihe ike n'isi; dika Jehova nyere Moses iwu. 14 Ọ kputa oke-ehi nke àjà-nmehie nso: Eron na umu-ya ndikom we bikwasi aka-ha n'oke-ehi nke àjà-nmehie. 15 O b͕ue ya; Moses we were ọbara-ya, tiye ya n'elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà ahu buruburu na nkpisi-aka-ya, wepu nmehie n'ebe-ichu-àjà ahu: ọbara ahu ka ọ wusi-kwa-ra na ntọ-ala ebe-ichu-àjà, do ya nsọ, ikpuchiri ya nmehie. 16 Ọ were abuba nile nke di n'elu ihe-ime, na mba-imeju nke imeju, na akọrọ abua, na abuba-ha, Moses we sure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà. 17 Ma oke-ehi ahu, na akpukpọ-ya, na anu-ya, na nsi-ya, o surere ha n'ọku n'azu ọmuma-ulo-ikwū; dika Jehova nyere Moses iwu. 18 Ọ weta nso ebulu nke àjà-nsure-ọku: Eron na umu-ya ndikom we bikwasi aka-ha n'isi ebulu ahu. 19 O b͕ue ya: Moses we wusa ọbara-ya n'ebe-ichu-àjà ahu buruburu. 20 Ọ bọ ebulu ahu n'ọbubọ-ya; Moses we sure isi-ya na ọbubọ-ya nile na abuba-ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ. 21 Ọ were miri sa ihe-ime-ya na ọlu-ukwu na ọlu-aka-ya; Moses we sure ebulu ahu nile ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà: àjà-nsure-ọku ka ọ bu ibu ihe ísì utọ: àjà-ọku anāchuru Jehova ka ọ bu; dika Jehova nyere Moses iwu. 22 Ọ we weta nso ebulu nke-ọzọ, bú ebulu nke nmeju-aka: Eron na umu-ya ndikom we bikwasi aka-ha n'isi ebulu ahu. 23 O b͕ue ya; Moses we were ufọdu nime ọbara-ya, tiye n'ọnu-ọnu nti aka-nri Eron, na n'isi-aka nke aka-nri-ya, na n'isi-ukwu nke ukwu aka-nri ya. 24 Ọ me ka umu-ndikom Eron biaru nso, Moses we were ufọdu nime ọbara ahu, tiye n'ọnu-ọnu nti aka-nri ha, na n'isi-aka nke aka-nri-ha, na n'isi-ukwu nke ukwu aka-nri ha: Moses we wusa ọbara ahu n'ebe-ichu-àjà buruburu. 25 Ọ were abuba-ya, na akuku ọdudu-ya nwere abuba, na abuba nile nke di n'elu ihe-ime-ya, na mba-imeju nke imeju, na akọrọ-ya abua, na abuba-ha, na utaku-ukwu aka-nri ya: 26 o si na nkata achicha ekoghi-eko ahu nke di n'iru Jehova were otù ob͕e achicha ekoghi-eko, na otù ob͕e achicha agwara manu, na otù mbadamba-achicha, tukwasi ha n'abuba ahu na n'utaku-ukwu aka-nri: 27 o tiye ha nile n'elu ọbu-aka abua nke Eron, na n'elu ọbu-aka nke umu-ya ndikom, we fé ha ka ha buru àjà-ofufé n'iru Jehova. 28 Moses we wepu ha n'elu ọbu-aka-ha, sure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà n'elu àjà-nsure-ọku ahu: nmeju-aka ka ha bu, ibu ihe ísì utọ: àjà-ọku anāchuru Jehova ka ọ bu. 29 Moses were kwa okpukpu-obi-ya, fé ya ka ọ buru àjà-ofufé n'iru Jehova: òkè Moses nwere ka ọ bu sitere n'ebulu nmeju-aka; dika Jehova nyere Moses iwu. 30 Moses were kwa ufọdu nime manu otite-manu ahu, na ufọdu nime ọbara nke di n'elu ebe-ichu-àjà, fesa n'aru Eron, na n'elu uwe-ya, na n'aru umu-ya ndikom, na n'elu uwe umu-ya ndikom tiyere ya; ọ we do Eron nsọ, do kwa uwe-ya, na umu-ya ndikom, na uwe umu-ya ndikom, nsọ tiyere ya. 31 Moses we si Eron na umu-ya ndikom, Sienu anu-ya n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute: ọ bu kwa n'ebe ahu ka unu gēri ya na achicha nke di na nkata nke nmeju-aka ahu, dika m'nyere n'iwu, si, Eron na umu-ya ndikom gēri ya. 32 Ma ihe nke fọduru nime anu ahu na nime achicha ahu, n'ọku ka unu gēsure ya. 33 Unu esi-kwa-la n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute pua ubọchi asa, rue ubọchi mb͕e ubọchi nile nke nmeju-aka-unu gēzu: n'ihi na ubọchi asa ka Ọ ganēmeju aka-unu. 34 Dika emere ta, otú a ka Jehova nyere iwu ime, ikpuchiri unu nmehie-unu. 35 Ọ bu kwa n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute ka unu gānọgide ehihie na abali ubọchi asa, debe kwa ihe-ndebe nke Jehova, ka unu we ghara inwu: n'ihi na otú a ka enyeworom iwu. 36 Eron na umu-ya ndikom we me ihe nile Jehova nyere n'iwu site n'aka Moses.

Levitikọs 9

1 O rue, n'ubọchi nke-asatọ, na Moses kpọrọ Eron na umu-ya ndikom, na ndi-okenye Israel; 2 ọ si Eron, Were n'onwe-gi nwa-oke-ehi ka ọ buru àjà-nmehie, na ebulu ka ọ buru àjà-nsure-ọku, nke zuru okè ka ha gābu, gi weta kwa ha nso n'iru Jehova. 3 Umu Israel ka i gāgwa kwa okwu, si, Werenu nkpi ka ọ buru àjà-nmehie; na nwa-ehi na nwa-aturu, ha abua gāb͕a otù arọ, bú nke zuru okè, ka ha buru àjà-nsure-ọku; 4 chiri kwa ehi na ebulu ka ha buru àjà-udo, ichu n'iru Jehova; were kwa onyinye-inata-iru-ọma agwara manu: n'ihi na ta ka Jehova gēme ka unu hu Ya anya. 5 Ha we weta ihe Moses nyere n'iwu n'iru ulo-ikwū nzute: nzukọ Israel nile we biaru nso guzo kwa n'iru Jehova. 6 Moses we si, Nka bu ihe Jehova nyere n'iwu ka unu me: agēme kwa ka unu hu ebube Jehova anya. 7 Moses we si Eron, Biarue ebe-ichu-àjà nso, me àjà-nmehie-gi, na àjà-nsure-ọku-gi, kpuchiere onwe-gi, kpuchi-kwa-ra ndi Israel, nmehie-unu; me kwa onyinye iji biaru nso nke ndi ahu, kpuchi-kwa-ra ha nmehie-ha; dika Jehova nyere iwu. 8 Eron we biarue ebe-ichu-àjà nso, b͕ue nwa-ehi nke àjà-nmehie nke diri ya onwe-ya. 9 Umu-ndikom Eron we wetara ya nso ọbara-ya: ọ we deye nkpisi-aka-ya n'ọbara ahu, tiye n'elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà, we wusi ọbara na ntọ-ala ebe-ichu-àjà: 10 ma abuba, na akọrọ abua, na mba-imeju nke putara n'imeju, nke si n'àjà-nmehie puta, o surere ha ọku ibu ihe-nsure ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà; dika Jehova nyere Moses iwu. 11 Ma anu-ya na akpukpọ-ya, o surere ha n'ọku n'azu ọmuma-ulo-ikwū. 12 Ọ we b͕ue ihe àjà-nsure-ọku: umu-ndikom Eron we me ka ọbara-ya rue ya aka, ọ we wusa ya n'ebe-ichu-àjà buruburu. 13 Àjà-nsure-ọku ka ha me-kwa-ra ka o rue ya aka, n'ọbubọ, na isi-ya; ọ we sure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà. 14 Ọ we sa ihe-ime-ya na ọlu-ukwu na ọlu-aka-ya, sure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'elu àjà-nsure-ọku n'ebe-ichu-àjà. 15 Ọ we weta nso onyinye iji biaru nso nke ndi Israel, were nkpi nke àjà-nmehie nke diri ndi ahu, b͕ue ya, chua ya n'àjà bayere nmehie, dika nke-mbu. 16 Ọ weta kwa àjà-nsure-ọku nso, me ya dika ikpé bayere ya si di. 17 Ọ weta kwa nso onyinye-inata-iru-ọma, si nime ya meju ọbu-aka-ya, sure ya ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà, tiyere àjà-nsure-ọku nke ututu. 18 O b͕u-kwa-ra ehi ahu na ebulu ahu, bú ihe àjà nke àjà-udo, nke diri ndi Israel: umu-ndikom Eron we me ka ọbara-ya rue ya aka, ọ we wusa ya n'ebe-ichu-àjà buruburu, 19 ha me-kwa-ra ka abuba nile nke putara n'ehi ahu rue ya aka; na ihe putara n'ebulu ahu, bú akuku ọdudu nwere abuba, na abuba nke nēkpuchi ihe-ime, na akọrọ abua, na mba-imeju nke imeju: 20 ha we tukwasi abuba ahu n'okpukpu-obi, ọ we sure abuba ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, n'ebe-ichu-àjà: 21 ma okpukpu-obi-ha na utaku-ukwu aka-nri ka Eron fere ka ha buru àjà-ofufé n'iru Jehova; dika Moses nyere iwu. 22 Eron we chilie aka-ya n'ebe ndi Israel nọ, gọzie ha; o si n'ime àjà-nmehie na àjà-nsure-ọku na àjà-udo rida. 23 Moses na Eron we ba n'ulo-ikwū nzute, puta kwa, gọzie ndi Israel: ewe me ka ndi ahu nile hu ebube Jehova anya. 24 Ọku we si n'iru Jehova puta, ripia àjà-nsure-ọku na abuba nile n'elu ebe-ichu-àjà: ndi Israel nile we hu ya, tie nkpu, da kpue iru-ha n'ala.

Levitikọs 10

1 Ma umu-ndikom Eron, bú Nedab na Abaihu, were ihe-igu-ọku, onye ọ bula ọ were nke ya, ha we tiye ọku nime ha, tukwasi ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ya, we weta nso n'iru Jehova ọku ala ọzọ, nke Ọ nēnyeghi ha n'iwu. 2 Ọku we si n'iru Jehova puta, ripia ha, ha we nwua n'iru Jehova. 3 Moses we si Eron, Nka bu ihe Jehova kwuru, si, N'aru ndi nābiarum nso ka agēdom nsọ, ọ bu kwa n'iru ndim nile ka agāsọpurum. Eron we b͕a nkiti. 4 Moses we kpọ Mishael na Elzafan, bú umu-ndikom Uziel nwa-nne nna Eron, si ha, Biaruenu nso, si n'iru ebe nsọ a bupu umu-nne-unu je n'azu ọmuma-ulo-ikwū. 5 Ha we biaru nso, buru ha n'uwe-ime-ha je n'azu ọmuma-ulo-ikwū; dika Moses kwuru. 6 Moses we si Eron, ọ si kwa Eleeza na Itama, bú umu-ya ndikom, Unu akọpula agiri-isi-unu, unu adọwa-kwa-la uwe-unu; ka unu we ghara inwu, ka Ọ we ghara kwa iwe iwe megide nzukọ Israel nile: ma ka umu-nne-unu, bu ulo nile nke Israel, kwara nsure-ọku ahu nke Jehova sureworo akwá. 7 Unu esi-kwa-la n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute pua, ka unu we ghara inwu: n'ihi na manu otite-manu nke Jehova dikwasi unu. Ha we me dika okwu Moses si di. 8 Jehova we gwa Eron okwu, si, 9 Aṅula manya-vine ma-ọbu ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, gi onwe-gi, na umu-gi ndikom tiyere gi, mb͕e unu nābà n'ulo-ikwū nzute, ka unu we ghara inwu; ọ gābu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile: 10 ka unu we kpa kwa ókè n'etiti ihe nsọ na ihe nādighi nsọ, na n'etiti ihe ruru árú na ihe di ọcha; 11 ka unu we zí kwa umu Israel ukpuru nile nke Jehova gwaworo ha site n'aka Moses. 12 Moses we gwa Eron okwu, ọ gwa kwa Eleeza na Itama, bú umu-ya ndikom fọduru, si, Werenu onyinye-inata-iru-ọma nke fọduru site n'àjà-ọku nke Jehova, rie ya n'ekoghi-eko na nso ebe-ichu-àjà: n'ihi na ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu. 13 Unu gēri kwa ya n'ebe di nsọ, n'ihi na òkè-gi, na òkè umu-gi ndikom, ka ọ bu, sitere n'àjà-ọku nile nke Jehova: n'ihi na otú a ka enyeworom iwu. 14 Okpukpu-obi nke àjà-ofufé na utaku-ukwu nke àjà-nbuli ka unu gēri kwa n'ebe di ọcha; gi onwe-gi, na umu-gi ndikom, na umu-gi ndinyom tiyere gi: n'ihi na dika òkè-gi na òkè umu-gi ndikom ka enyeworo ha site n'ihe àjà nile nke àjà-udo nile nke umu Israel. 15 Utaku-ukwu nke àjà-nbuli na okpukpu-obi nke àjà-ofufé ka ha gēweta n'elu àjà-ọku nile nke abuba nile, ifé ya ka ọ buru àjà-ofufé n'iru Jehova: ọ gābu kwa nke gí, na nke umu-gi ndikom tiyere gi, dika òkè-unu ebighi-ebi; dika Jehova nyere iwu. 16 Moses we chọsie nkpi nke àjà-nmehie ike, ma, le, esurewo ya ọku: ọ we iwe n'aru Eleeza na n'aru Itama, bú umu-ndikom Eron fọduru, si, 17 Gini mere unu erighi àjà-nmehie n'ebe nke ebe nsọ ahu? n'ihi na ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu, ọ bu kwa ya ka O nyeworo unu ibupu ajọ omume nke nzukọ Israel, ikpuchiri ha nmechie-ha n'iru Jehova. 18 Le, ebubataghi ọbara-ya n'ebe nsọ a nime: unu aghaghi iri ya n'ebe nsọ a, dika m'nyere iwu. 19 Eron we gwa Moses okwu, si, Le, ta ka ha wetaworo àjà-nmehie-ha na àjà-nsure-ọku-ha nso n'iru Jehova; ihe dika ihe ndia we dakwasim: asi kwa na eririm àjà-nmehie ahu ta, ọ̀ gādi nma n'anya Jehova? 20 Mb͕e Moses nuru ya, ọ we di nma n'anya-ya.

Levitikọs 11

1 Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si ha, 2 Gwanu umu Israel okwu, si, Ndia bu anu di ndu unu gēri n'etiti anumanu nile nke di n'elu uwa. 3 Anu ọ bula nke ukwu-ya wara njakpa, nke ukwu-ya wara-kwa-ra awara, nke nātaghari kwa ọnu, n'etiti anumanu, nke ahu ka unu gēri. 4 Otú ọ di, ndia ka unu nāgaghi-eri n'etiti ihe nātaghari ọnu, ma-ọbu n'etiti ndi ukwu-ha wara njakpa: camel, n'ihi na ihe nātaghari ọnu ka ọ bu, ma ọ bughi ihe ukwu-ya wara njakpa, ihe ruru árú ka ọ buru unu. 5 Coney kwa, n'ihi na ihe nātaghari ọnu ka ọ bu, ma ukwu-ya awaghi njakpa, ihe ruru árú ka ọ buru unu. 6 Hare kwa, n'ihi na ihe nātaghari ọnu ka ọ bu, ma ukwu-ya awaghi njakpa, ihe ruru árú ka ọ buru unu. 7 Ezì kwa, n'ihi na ihe ukwu-ya wara njakpa, nke ukwu-ya wara-kwa-ra awara, ka ọ bu, ma ya onwe-ya adighi-ataghari ọnu, ihe ruru árú ka ọ buru unu. 8 Unu erila ihe sitere n'anu-ha, unu emetu-kwa-la ozu-ha aka; ihe ruru árú ka ha buru unu. 9 Ndia ka unu gēri n'etiti ihe nile nke di na miri: ihe ọ bula nke nwere ntù na akpilikpa nime miri, n'oké osimiri nile, na n'osimiri nile, ha ka unu gēri. 10 Ma ihe ọ bula nke nēnweghi ntù na akpilikpa n'oké osimiri nile, na n'osimiri nile, site n'ihe nile nēnuputa na miri, site kwa n'anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nke di nime miri, ihe-árú ka ha buru unu, 11 ihe-árú ka ha gābu-kwa-ra unu; unu erila ihe sitere n'anu-ha, unu gāgu kwa ozu-ha n'ihe-árú. 12 Ihe ọ bula nke nēnweghi ntù na akpilikpa nime miri, ihe-árú ka ọ buru unu. 13 Ndia ka unu gāgu kwa n'ihe-árú n'etiti anu-ufe; agaghi-eri ha, ihe-árú ka ha bu: ugo, na ego-agwọ, na ugo-azù; 14 na ndab͕u, na agu-nkwọ di iche iche; 15 ugolo-ọma ọ bula di iche iche; 16 na enyi-nnunu, na eb͕e-abali, na nnunu oké osimiri, na eb͕e di iche iche; 17 na okwukwu ntà, na cormorant, na okwukwu oku; 18 na okwukwu nwere mpi, na okwolo, na udele; 19 na ub͕ala, na utù di iche iche, na hoopoe, na usu. 20 Anu-ufe ọ bula nke nēnuputa enuputa, nke nēje ije n'ukwu anọ, ihe-árú ka ọ buru unu. 21 Ma otú ọ di, ndia ka unu gēri n'etiti anu-ufe nile nēnuputa enuputa, nke nēje ije n'ukwu anọ, nke nwere ogwe-ukwu n'elu ukwu-ala-ha, iji nākwu ntù n'elu ala; 22 ndia ka unu gēri n'etiti ha; igurube di iche iche, na akpa-nkwu di iche iche, na nbuzu di iche iche, na ogugu di iche iche. 23 Ma anu-ufe ọ bula nke nēnuputa enuputa, nke nwere ukwu anọ, ihe-árú ka ọ buru unu. 24 N'ihi ihe ndia ka unu gēme onwe-unu ndi ruru árú: onye ọ bula nke nēmetu ozu-ha aka gāru árú rue anyasi: 25 onye ọ bula nke nēbu ihe sitere n'ozu-ha gāsu uwe-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi. 26 Anumanu ọ bula nke bu ihe ukwu-ya wara njakpa, ma ọ bughi ihe ukwu-ya warara awara, ọ bughi kwa ihe nātaghari ọnu, ihe ruru árú ka ha buru unu: onye ọ bula nke nēmetu ha aka gāru árú. 27 Ihe ọ bula kwa nke nēje ije n'ọbu-aka-ya, n'etiti anu nile di ndu nke nēje ije n'ukwu anọ, ihe ruru árú ka ha buru unu: onye ọ bula nke nēmetu ozu-ha aka gāru árú rue anyasi. 28 Onye nēbu ozu-ha gāsu uwe-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi: ihe ruru árú ka ha buru unu. 29 Ndia bu-kwa-ra unu ihe ruru árú n'etiti ihe nēnuputa enuputa, nke nēnuputa n'elu uwa: weasel, na oké, na agu-iyi di iche iche, 30 na ọba-miri, na ngwere-aghu, na ngwere, na ngwere-uzuzu, na owumagana. 31 Ndia buru unu ihe ruru árú n'etiti ihe nile nēnuputa enuputa: onye ọ bula nke nēmetu ha aka mb͕e ha nwuru anwu gāru árú rue anyasi. 32 Ihe ọ bula nke otù nime ha gādakwasi, mb͕e ha nwuru, ọ gāru kwa árú: ma ọ bu ihe osisi ọ bula, ma-ọbu uwe, ma-ọbu akpukpọ, ma-ọbu àkpà, ihe ọ bula nke eji ya eje ozi ọ bula, agētiye ya na miri, ọ gāru kwa árú rue anyasi; o we di ọcha. 33 Ihe ájá ọ bula nke otù nime ha gādabà nime ya, ihe ọ bula nke di nime ya gāru árú, ihe ájá ahu ka unu gētiwa kwa. 34 Nime ihe-oriri nile nke anēri, nke ahu nke miri di otú a gābiakwasi gāru árú: ihe-ọṅuṅu nile nke anāṅu nime ihe ọ bula di otú a gāru kwa árú. 35 Ihe ọ bula nke ihe si n'ozu-ha gādakwasi gāru kwa árú; ma ọ bu ite-ọku, ma-ọbu ekwu, agākwatu ya: ihe ruru árú ka ha bu, ihe ruru árú ka ba gābu-kwa-ra unu. 36 Ma otú ọ di, isi-iyi ma-ọbu olùlù-miri, bú nchikọta miri, gādi ọcha: ma onye nēmetu ozu-ha aka gāru árú. 37 Ma mb͕e ihe nke si n'ozu-ha gādakwasi nkpuru-ọghigha ọ bula nke anāgha agha, ihe di ọcha ka ọ bu. 38 Ma mb͕e agētiye miri n'elu nkpuru-ọghigha, ma ihe si n'ozu-ha adakwasi ya, ihe ruru árú ka ọ buru unu. 39 Ọzọ, mb͕e otù nime anumanu, nke buru unu ihe-oriri, gānwu; onye nēmetu ozu-ya aka gāru árú rue anyasi. 40 Onye nēri ufọdu nime ozu-ya gāsu uwe-ya, ru kwa árú rue anyasi: onye ahu nke nēbu ozu-ya gāsu kwa uwe-ya, ru kwa árú rue anyasi. 41 Ọzọ ihe ọ bula nke nēnuputa enuputa nke nēnuputa n'elu uwa, ihe-árú ka ọ bu; agaghi-eri ya. 42 Ihe ọ bula nke nēje ije n'afọ-ya, na ihe ọ bula nke nēje ije n'ukwu anọ, ma-ọbu ihe ọ bula nwere ọtutu ukwu, ọbuná ihe nile nēnuputa enuputa nke nēnuputa n'elu uwa, unu erila ha; n'ihi na ihe ruru árú ka ha bu. 43 Unu ejila ihe-nnuputa ọ bula nke nēnuputa enuputa me onwe-unu ka unu buru ihe-árú, unu eji-kwa-la ha meru onwe-unu, ewe were ha meru unu. 44 N'ihi na Mu onwem bu Jehova Chineke-unu: unu gēdo kwa onwe-unu nsọ, we di nsọ; n'ihi na nsọ ka Mu onwem di: unu eji-kwa-la ihe-nnuputa ọ bula nke nākpu akpu n'elu uwa meru onwe-unu. 45 N'ihi na Mu onwem bu Jehova Nke nēme ka unu si n'ala Ijipt rigoputa, iburu unu Chineke: unu gādi kwa nsọ, n'ihi na nsọ ka Mu onwem di. 46 Nka bu iwu nke anumanu, na nke anu-ufe, na nke anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nke nākpu akpu nime miri, na nke anu ọ bula nēnuputa enuputa n'elu uwa: 47 ka ewe kpa ókè n'etiti ihe ruru árú na ihe di ọcha, na n'etiti anu di ndu anēri eri na anu di ndu anādighi-eri eri.

Levitikọs 12

1 Jehova we gwa Moses okwu, si, 2 Gwa umu Israel okwu, si, Nwayi, mb͕e ọ gātu ime, mua nwa-nwoke, ọ gāru kwa árú ubọchi asa; dika ubọchi idi-na-nsọ nke isọ-uba-ya si di, otú a ka ọ gāru árú. 3 N'ubọchi nke-asatọ agēbì ya úgwù n'anu-aru nke api-ya. 4 Orú ubọchi na iri na atọ ka nwayi ahu gānọgide n'ọbara nke ime ya ka ọ di ọcha; ọ dighi ihe nsọ ọ bula ọ gēmetu aka, ọ gaghi-abà kwa n'ebe nsọ ahu, rue ozùzù ubọchi nile nke ime ya ka ọ di ọcha. 5 Ma ọ buru na ọ mua nwa-nwayi, ọ gāru kwa árú ízù ubọchi asa abua, dika n'idi-na-nsọ-ya; ọ bu kwa ọgu ubọchi atọ na isi ka ọ gānọgide n'ọbara nke ime ya ka ọ di ọcha 6 N'ozuzù ubọchi nile nke ime ya ka ọ di ọcha bayere nwa-nwoke, ma-ọbu bayere nwa-nwayi, ọ gēwetara onye-nchu-àjà nwa-aturu nke b͕ara otù arọ ka ọ buru àjà-nsure-ọku, na nwa-kpalakwu-kwu, ma-ọbu nduru, ka ọ buru àjà-nmehie, rue ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute: 7 ọ gēweta kwa ya nso n'iru Jehova, kpuchiere ya nmehie-ya; agēme kwa ya ka ọ di ọcha site n'isi ọbara-ya. Nka bu iwu nke nwayi nke nāmu nwa, ma ọ bu nwoke ma-ọbu nwayi. 8 Ma ọ buru na aka-ya erughi ihe gēzù nwa-aturu, ọ gēwere-kwa nduru abua ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua; otù ka ọ buru àjà-nsure-ọku, ibe-ya ka ọ buru kwa àjà-nmehie: onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya, agēme kwa ya ka ọ di ọcha.

Levitikọs 13

1 Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si, 2 Madu, mb͕e ihe-otutó, ma-ọbu ọnyá, ma-ọbu ntupọ nke nēke uke, di n'akpukpọ nke anu-aru-ya, mb͕e ihe ahu gāghọ n'akpukpọ nke anu-aru-ya ihe-otiti ekpenta, agēme kwa ka ọ biakute Eron, bú onye-nchu-àjà, ma-ọbu biakute otù nime umu-ya ndikom, bú ndi-nchu-àjà: 3 onye-nchu-àjà gāhu kwa ihe-otiti ahu di n'akpukpọ nke anu-aru-ya: ma ọ buru na aji nke di n'ihe-otiti ahu ab͕anwewo ọchā, ọ buru kwa na, n'ile ihe-otiti ahu anya, ọ di omimi kari akpukpọ anu-aru-ya, ihe-otiti ekpenta ka ọ bu: onye-nchu-aja gāhu kwa ya, si na ọ ruru árú. 4 Ma ọ buru na ntupọ ahu nke nēke uke di ọcha n'akpukpọ anu-aru-ya, ọ buru kwa na ọ dighi omimi, n'ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya, ọ buru kwa na aji-ya abanweghi ọcha, onye-nchu-àjà gēme-chibido onye nwere ihe-otiti ahu nime ulo abali asa: 5 onye-nchu-àjà gāhu kwa ya anya n'ubọchi nke-asa: ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu eguzo n'anya-ya, ma ihe-otiti ahu abaghi aba n'akpukpọ-aru-ya, onye-nchu-àjà gēmechibido kwa ya nime ulo ubọchi asa ọzọ: 6 onye-nchu-àjà gāhu kwa ya n'ubọchi nke-asa ọzọ: ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu bu ihe anāhu inyoghi-inyoghi, ma ihe-otiti ahu abaghi aba n'akpukpọ-aru-ya, onye-nchu-àjà gāsi na ọ di ọcha; ọnyá efu ka ọ bu; ọ gāsu kwa uwe-ya, di ọcha. 7 Ma ọ buru na ọnya ahu aba aba nke-uku n'akpukpọ-aru-ya, mb͕e emesiri ka onye-nchu-àjà hu ya ime ka ọ di ọcha, ọ gēme kwa ka onye-nchu-àjà hu ya nke ub͕ò abua: 8 onye-nchu-àjà gāhu kwa ya, ma, le, ọ buru na ọnyá ahu abawo aba n'akpukpọ-aru-ya, onye-nchu-àjà gāsi na ọ ruru árú: ekpenta ka ọ bu. 9 Mb͕e ihe-otiti ekpenta di n'aru madu, agēme kwa ka ọ biakute onye-nchu-àjà; 10 onye-nchu-àjà gāhu kwa, ma, le, ọ buru na ihe-otutó ọcha di n'akpukpọ-aru-ya, ọ buru kwa na ihe ahu emewo aji ka ọ b͕anwe ọcha, onyá nke anu-aru ndu adi kwa n'ihe-otutó ahu, 11 ekpenta site na mb͕e ochie ka ọ bu n'akpukpọ anu-aru-ya, onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ ruru árú: ọ gaghi-emechibido ya nime ulo; n'ihi na onye ruru árú ka ọ bu. 12 Ọ buru kwa na ekpenta ab͕awaputa nke-uku n'akpukpọ-aru-ya, ekpenta ahu ewe kpuchie akpukpọ-aru nile nke onye nwere ihe-otiti ahu site n'isi-ya we rue ukwu-ala-ya, ọbuná ihe nile anya onye-nchu-àjà nāhu; 13 onye-nchu-àjà gāhu kwa ya: ma, le, ọ buru na ekpenta ekpuchiwo anu-aru-ya nile, ọ gāsi kwa na onye nwere ihe-otiti ahu di ọcha: aru-ya nile ab͕anwewo ọcha: ọcha ka ọ di. 14 Ma n'ubọchi anāhu anu-aru ndu nime ya, ọ gāru árú. 15 Onye-nchu-àjà gāhu kwa anu-aru ndu ahu, si na ọ ruru árú: anu-aru ndu ahu, ihe ruru árú ka ọ bu: ekpenta ka ọ bu. 16 Ma-ọbu mb͕e anu-aru ndu ahu gātughari, b͕anwe ọcha, ọ gābiakute kwa onye-nchu-àjà, 17 onye-nchu-àjà gāhu ya: ma, le ọ buru na ihe-otiti ahu ab͕anwewo ọcha, onye-nchu-àjà gāsi na onye nwere ihe-otiti ahu di ọcha: ọcha ka ọ di. 18 Ọzọ, anu-aru, mb͕e ihe-ofifi di nime ya n'akpukpọ-aru-ya, ma eme ka ọ la. 19 ihe-otutó ọcha we di n'ọnọdu ihe otiti ahu, ma-ọbu ntupọ nēke uke, nke di ọcha nācha ọbara-ọbara, agēme ka onye-nchu-àjà hu ya; 20 onye-nchu-àjà gāhu kwa ya, ma, le, ọ buru na ọ di ala, n'ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya, aji-ya ab͕anwewo kwa ọcha, onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ ruru árú: ihe-otiti ekpenta ka ọ bu, n'ihe-ofifi ahu ka ọ b͕awaputaworo. 21 Ma ọ buru na onye-nchu-àjà ahú ya, ma, le, aji ọcha adighi nime ya, ọ dighi kwa ala kari akpukpọ-aru-ya, kama ihe ahu bu ihe anāhu inyoghi-inyoghi, onye-nchu-àjà gēmechibido ya nime ulo ubọchi asa; 22 ma ọ buru na ọ ba aba nke-uku n'akpukpọ-aru-ya, onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ ruru árú: ihe-otiti ka ọ bu. 23 Ma ọ buru na ntupọ ahu nke nēke uke eguzo n'ọnọdu-ya, ma ọ baghi aba, apa ihe-ofifi ahu ka ọ bu; onye-nchu-àjà gāsi na ọ di ọcha. 24 Ma-ọbu anu-aru, mb͕e ọku-ọruru di n'akpukpọ-aru-ya, mb͕e anu-aru ndu nke ọku-ọruru ahu gāghọ ntupọ nēke uke, nke di ọcha nācha ọbara-ọbara, ma-ọbu ọcha; 25 onye-nchu-àjà gāhu ya: ma, le, ọ buru na aji ab͕anwewo ọcha nime ntupọ ahu nēke uke, ọ di kwa omimi, n'ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya; ekpenta ka ọ bu, n'ọku-ọruru ahu ka ọ b͕awaputaworo: onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ ruru árú: ihe-otiti ekpenta ka ọ bu. 26 Ma ọ buru na onye-nchu-àjà ahú ya, ma, le, aji ọcha adighi nime ntupọ ahu nēke uke ọ dighi kwa ala kari akpukpọ-aru-ya, kama ihe ahu bu ihe anāhu inyoghi-inyoghi; onye-nchu-àjà gēmechibido kwa ya nime ulo ubọchi asa: 27 onye-nchu-àjà gāhu kwa ya n'ubọchi nke-asa: ọ buru na ọ ba aba nke-uku n'akpukpọ-aru-ya, onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ ruru árú: ihe-otiti ekpenta ka ọ bu. 28 Ma ọ buru na ntupọ nke nēke uke eguzo n'ọnọdu-ya ma ọ baghi aba n'akpukpọ-aru-ya, kama ihe ahu bu ihe anāhu inyoghi-inyoghi; ihe-otutó nke ọku-ọruru ahu ka ọ bu, onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ di ọcha: n'ihi na apa ọku-ọruru ahu ka ọ bu. 29 Ma nwoke ma-ọbu nwayi, mb͕e ihe-otiti di n'aru-ya, n'isi ma-ọbu n'afu-ọnu, 30 onye-nchu-àjà gāhu ihe-otiti ahu: ma, le ọ, buru na ọ di omimi, n'ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya, ọ buru kwa na aji nācha edo edo, nke di irighiri, di nime ya, onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ ruru árú: ọria isi ka ọ bu, ekpenta nke isi ma-ọbu nke afu-ọnu ka ọ bu. 31 Ma mb͕e onye-nchu-àjà gāhu ihe-otiti nke ọria-isi ahu, ma, le, ọ dighi omimi, n'ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya, aji oji adighi kwa nime ya, onye-nchu-àjà gēmechibido kwa onye nwere ihe-otiti ọria-isi ahu nime ulo ubọchi asa: 32 onye-nchu-àjà gāhu kwa ihe-otiti ahu n'ubọchi nke-asa: ma, le, ọ buru na ọria-isi ahu abaghi aba, ọ buru kwa na aji nke nācha edo edo adighi nime ya, ọ buru kwa na ọria-isi ahu adighi omimi, n'ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya, 33 agākọpu kwa isi-ya, ma, ọ gaghi-akọpu ọria-isi ahu: onye-nchu-àjà gēmechibido kwa onye nwere ọria-isi ahu ubọchi asa ọzọ: 34 onye-nchu-àjà gāhu kwa ọria-isi ahu n'ubọchi nke-asa: ma, le, ọ buru na ọria-isi abaghi aba n'akpukpọ-aru-ya, ọ buru kwa na ọ dighi omimi, n'ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya; onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ di ọcha: ọ gāsu kwa uwe-ya nile, di ọcha. 35 Ma ọ buru na ọria-isi-ya aba aba nke-uku n'akpukpọ-aru-ya mb͕e emesiri ka ọ di ọcha; 36 onye-nchu-àjà gāhu kwa ya: ma, le, ọ buru na ọria-isi abawo aba n'akpukpọ-aru-ya, onye-nchu-àjà agaghi-achọ aji nācha edo edo ahu; onye ruru árú ka ọ bu. 37 Ma ọ buru na ọria-isi ahu eguzowo n'anya-ya, ọ buru kwa na aji oji epuputawo nime ya; emewo ka ọria-isi ahu la, ọcha ka ọ di: onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ di ọcha. 38 Ma nwoke ma-ọbu nwayi, mb͕e ntupọ di iche iche nke nēke uke, bú ntupọ nēke uke nke di ọcha, di n'akpukpọ anu-aru-ha; 39 onye-nchu-àjà gāhu kwa: ma, le, ọ buru na ntupọ di iche iche nke nēke uke acha ọcha inyoghi-inyoghi, bú nke di n'akpukpọ anu-aru-ha; ngwọ ka ọ bu, ọ b͕awa-putawo n'akpukpọ-aru-ya; ocha ka ọ di. 40 Ma onye ọ bula, mb͕e agiri-isi kwọchapuworo n'isi-ya, onye-isi-nkwọcha ka ọ bu; ọcha ka ọ di. 41 Ọ buru kwa na agiri-isi-ya akwọchapuwo n'isi-ya na nko iru-ya, onye egedege-iru-ya kwọchara akwọcha ka ọ bu: ọcha ka ọ di. 42 Ma mb͕e ihe-otiti nke di ọcha nācha ọbara di n'isi-nkwọcha ahu ma-ọbu n'egedege-iru ahu kwọchara akwọcha; ekpenta nke nāb͕awaputa n'isi-nkwọcha-ya, ma-ọbu n'egedege-iru-ya kwọchara akwọcha, ka ọ bu. 43 Onye-nchu-àjà gāhu kwa ya: ma, le, ọ buru na ihe-otutó nke ihe-otiti ahu di ọcha nācha ọbara-ọbara n'isi-nkwọcha-ya ma-ọbu n'egedege-iru-ya kwọchara akwọcha, dika ekpenta nke akpukpọ anu-aru si di, n'ile ya anya; 44 onye-ekpenta ka ọ bu, ihe ruru árú ka ọ bu: onye-nchu-àjà aghaghi isi na ọ ruru árú; n'isi-ya ka ihe-otiti-ya di. 45 Ma onye-ekpenta, nke ihe-otiti ahu di n'aru ya, uwe-ya nile gābu ihe dọwara adọwa, agiri-isi-ya ganātọpu kwa atọpu, o gēkpuchi kwa eb͕ub͕ere-ọnu-ya nke-elu, nākpọ, si, Onye ruru árú, onye ruru árú. 46 Ubọchi nile nke ihe-otiti ahu di n'aru ya ka ọ gāru árú; onye ruru árú ka ọ bu: ọ gēbi iche; n'azu ọmuma-ulo-ikwū ka ebe-obibi-ya gābu. 47 Uwe kwa, mb͕e ihe-otiti ekpenta di nime ya, ma ọ bu uwe aji-anu, ma-ọbu uwe flax; 48 ma ọ bu nke akpara ogologo, ma-ọbu nke akpara uhie; nke flax, ma-ọbu nke aji-anu; ma ọ bu n'akpukpọ, ma-ọbu n'ihe ije-ozi ọ bula eji akpukpọ me: 49 ọ buru kwa na ihe-otiti ahu acha akwukwọ ndu akwukwọ ndu ma-ọbu ọbara-ọbara n'uwe, ma-ọbu n'akpukpọ, ma-ọbu na nke akpara ogologo, ma-ọbu na nke akpara uhie, ma-ọbu n'ihe akpukpọ ọ bula; ihe-otiti ekpenta ka ọ bu, agēme kwa ka onye-nchu-àjà hu ya: 50 onye-nchu-àjà gāhu ihe-otiti ahu, mechibido kwa ihe nwere ihe-otiti nime ulo ubọchi asa: 51 ọ gāhu kwa ihe-otiti ahu n'ubọchi nke-asa: mb͕e ihe-otiti ahu baworo aba n'uwe, ma ọ bu na nke akpara ogologo, ma-ọbu na nke akpara uhie, ma-ọbu n'akpukpọ, nke ihe ọ bula agēji akpukpọ me iji je ozi; ekpenta nke jọb͕uru onwe-ya ka ihe-otiti ahu bu; ihe ruru árú ka ọ bu. 52 O gēsure kwa uwe ahu ọku, ma ọ bu nke akpara ogologo, ma-ọbu nke akpara uhie, n'aji-anu ma-ọbu na flax, ma-ọbu ihe akpukpọ ọ bula, nke ihe-otiti ahu di nime ya: n'ihi na ekpenta jọb͕uru onwe-ya ka ọ bu; n'ọku ka agēsure ya. 53 Ma ọ buru na onye-nchu-àjà ahú, ma, le, ihe-otiti ahu abaghi aba n'uwe ahu, ma ọ bu na nke akpara ogologo, ma ọbu na nke akpara uhie, ma-ọbu n'ihe akpukpọ ọ bula; 54 onye-nchu-àjà gēnye kwa iwu ka ha sua ihe ahu nke ihe-otiti ahu di nime ya, o gēmechibido kwa ya nime ulo ubọchi asa ọzọ: 55 onye-nchu-àjà gāhu kwa, mb͕e asuchasiri ihe-otiti ahu: ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu ab͕anweghi iru-ya, ọ buru kwa na ihe-otiti ahu abaghi aba, ihe ruru árú ka ọ bu; n'ọku ka i gēsure ya: ekpenta ka ọ bu, ma ọ bu n'isi-nkwọcha-ya ma-ọbu n'egedege-iru-ya kwọchara akwọcha. 56 Ma ọ buru na onye-nchu-àjà ahú, ma, le, ihe-otiti ahu bu ihe anāhu inyoghi-inyoghi mb͕e asuchasiri ya, ọ gādọwapu kwa ya nime uwe ahu, ma-ọbu nime akpukpọ ahu, ma-ọbu nime nke akpara ogologo, ma-ọbu nime nke akpara uhie. 57 Ma ọ buru na anāhu ya n'uwe ub͕u a, ma ọ bu na nke akpara ogologo, ma-ọbu na nke akpara uhie, ma-ọbu na nke ihe akpukpọ ọ bula, ihe nāb͕awaputa ka ọ bu: n'ọku ka i gēsure ihe ahu nke ihe-otiti ahu di nime ya. 58 Uwe ahu kwa, ma ọ bu nke akpara ogologo, ma-ọbu nke akpara uhie, ma-ọbu ihe akpukpọ ọ bula, nke i gāsu, ọ buru na ihe-otiti ahu esiwo nime ha wezuga onwe-ya, agāsu kwa ya nke ub͕ò abua, ọ gādi kwa ọcha. 59 Nka bu iwu nke ihe-otiti ekpenta n'uwe aji-anu ma-ọbu nke flax, ma ọ bu na nke akpara ogologo, ma-ọbu na nke akpara uhie, ma-ọbu ihe akpukpọ ọ bula, isi na ọ di ọcha, ma-ọbu isi na ọ ruru árú.

Levitikọs 14

1 Jehova we gwa Moses okwu, si, 2 Nka gābu iwu onye-ekpenta n'ubọchi anēme ya ka ọ di ọcha: na agēme ya ka ọ biakute onye-nchu-àjà: 3 onye-nchu-àjà gāpu kwa je n'azu ọmuma-ulo-ikwū: onye-nchu-àjà gāhu kwa, ma, le, ọ buru na emewo ka ihe-otiti ekpenta si n'aru onye-ekpenta ahu la; 4 onye-nchu-àjà gēnye kwa iwu ka ewere nnunu abua di ndu di kwa ọcha, na osisi cedar, na ogho uhie, na hyssop, bayere onye anēme ka ọ di ọcha: 5 onye-nchu-àjà gēnye kwa iwu ka eb͕ue otù nime nnunu ahu nime ihe ájá n'elu miri nērù erù: 6 nnunu ahu nke di ndu, o gēwere ya, na osisi cedar ahu, na ogho uhie ahu, na hyssop ahu, sue ha na nnunu ahu di ndu n'ọbara nnunu ahu eb͕uru n'elu miri nērù erù: 7 ọ gēfesa kwa ya ub͕ò asa n'aru onye-ahu anēme ka ọ di ọcha n'ekpenta, ọ gāsi kwa na ọ di ọcha, o gēzilaga kwa nnunu ahu di ndu nime ọhia sara iru. 8 Onye ahu anēme ka ọ di ọcha gāsu kwa uwe-ya nile, kọpu kwa aji-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gādi kwa ọcha: emesi kwa ọ gābata nime ọmuma-ulo-ikwū, ma ọ gānọdu n'ezí ulo-ikwū-ya ubọchi asa. 9 O gēru kwa n'ubọchi nke-asa, na ọ gākọpu aji-ya nile, bú agiri-isi-ya, na afu-ọnu-ya, na iku-anya-ya, ọbuná aji-ya nile ka ọ gākọpu: ọ gāsu kwa uwe-ya nile, were kwa miri sa anu-aru-ya, ọ gādi kwa ọcha. 10 Ma n'ubọchi nke-asatọ ọ gēwere umu-ebulu abua zuru okè, na otù nwa-aturu zuru okè nke bu nne, nke b͕ara otù arọ, na uzọ atọ n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour ka ọ buru onyinye-inata-iru-ọma, nke agwara manu, na otù log nke manu. 11 Onye-nchu-àjà nke nēme ya ka ọ di ọcha gēguzo kwa nwoke ahu anēme ka ọ di ọcha, na ihe ahu di iche iche, n'iru Jehova, n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute ahu: 12 onye-nchu-àjà gēwere kwa otù nime umu-ebulu ahu, weta ya nso ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma, ya na log nke manu ahu, ọ gēfé kwa ha ka ha buru àjà-ofufé n'iru Jehova: 13 o gēb͕u kwa nwa-ebulu ahu n'ebe o nēb͕u àjà-nmehie na àjà-nsure-ọku, n'ebe nke ebe nsọ ahu; n'ihi na, dika àjà-nmehie, àjà-ikpe-ọmuma bu ihe onye-nchu-àjà nwere: ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu: 14 onye-nchu-àjà gēwere kwa ufọdu nime ọbara nke àjà-ikpe-ọmuma ahu, onye-nchu-àjà gētiye kwa ya n'ọnu-ọnu nti aka-nri nke onye anēme ka ọ di ọcha, na n'isi-aka nke aka-nri-ya, na n'isi-ukwu nke ukwu aka nri ya: 15 onye-nchu-àjà gēweta kwa ufọdu nime log nke manu ahu, wusi ya n'ọbu-aka-ekpe nke onye-nchu-àjà ahu: 16 onye-nchu-àjà gēdeye kwa nkpisi-aka-nri-ya nime manu nke di n'ọbu-aka-ekpe-ya, ọ gēwere kwa nkpisi-aka-ya fesa ufọdu nime manu ahu ub͕ò asa n'iru Jehova: 17 ufọdu nime manu nke fọduru n'ọbu-aka-ya ka onye-nchu-àjà gētiye kwa n'ọnu-ọnu nti aka-nri nke onye ahu anēme ka ọ di ọcha, na n'isi-aka nke aka-nri-ya, na n'isi-ukwu nke ukwu aka-nri ya, n'elu ọbara àjà-ikpe-ọmuma: 18 ma manu nke fọduru n'ọbu-aka nke onye-nchu-àjà, o gētiye ya n'isi onye anēme ka ọ di ọcha: onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya n'iru Jehova. 19 Onye-nchu-àjà gēme kwa àjà-nmehie, kpuchiere ya nmehie-ya, bú onye anēme ka o si n'ọrurú-ya di ọcha; emesia o gēb͕u kwa àjà-nsure-ọku: 20 onye-nchu-àjà gēsure kwa àjà-nsure-ọku na onyinye-inata-iru-ọma n'ebe-ichu-aja: onye-nchu-aja gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya, ọ gādi kwa ọcha. 21 Ma ọ buru na ob͕eye ka ọ bu, nke aka-ya nērughi kwa ya, o gēwere kwa otù nwa-ebulu ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma ibu àjà-ofufè, ikpuchiri ya nmehie-ya, na otù uzọ n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour agwara manu ka ọ buru onyinye-inata-iru-ọma, na otù log nke manu; 22 na nduru abua, ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua, nke aka-ya ruru; otù gābu kwa àjà-nmehie, ibe-ya gābu àjà-nsure-ọku. 23 Ọ gēweta-kwa-ra ha onye-nchu-aja n'ubọchi nke-asatọ ime ka ọ di ọcha, rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, n'iru Jehova. 24 Onye-nchu-aja gēwere kwa nwa-aturu ahu nke àjà-ikpe-ọmuma, na log manu ahu, onye-nchu-aja gēfé kwa ha ka ha buru àjà-ofufé n'iru Jehova: 25 o gēb͕u kwa nwa-aturu àjà-ikpe-ọmuma ahu, onye-nchu-aja gēwere kwa ufọdu nime ọbara àjà-ikpe-ọmuma ahu, tiye ya n'ọnu-ọnu nti aka-nri nke onye anēme ka ọ di ọcha, na n'isi-aka nke aka-nri-ya, na n'isi-ukwu nke ukwu aka-nri ya: 26 ọ bu kwa ufọdu nime manu ahu ka onye-nchu-aja gāwusi n'ọbu-aka-ekpe onye-nchu-aja ahu: 27 onye-nchu-aja gēwere kwa nkpisi-aka-nri-ya fesa ufọdu nime manu nke di n'ọbu-aka-ekpe-ya ub͕ò asa n'iru Jehova: 28 onye-nchu-aja gētiye kwa ufọdu nime manu nke di n'ọbu-aka-ya n'ọnu-ọnu nti aka-nri nke onye anēme ka ọ di ọcha, na n'isi-aka nke aka-nri-ya, na n'isi-ukwu nke ukwu aka-nri ya, n'elu ebe ọbara àjà-ikpe-ọmuma ahu: 29 ma nke fọduru nime manu nke di n'ọbu-aka onye-nchu-aja, o gētiye ya n'elu isi onye anēme ka ọ di ọcha, ikpuchiri ya nmehie-ya n'iru Jehova. 30 Ọ gāchu kwa otù nime nduru ahu n'àjà, ma-ọbu nime umu-kpalakwukwu ahu, nime ihe aka-ya ruru; 31 ọbuná ihe aka-ya ruru, otù ka ọ buru àjà-nmehie, ibe-ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku, n'elu onyinye-inata-iru-ọma: onye-nchu-aja gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya, bú onye anēme ka ọ di ọcha n'iru Jehova. 32 Nka bu iwu nke onye ahu ihe-otiti ekpenta di n'aru ya, onye aka-ya nērughi n'ihe ime ya ka ọ di ọcha. 33 Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si, 34 Mb͕e unu gābata n'ala Kenean, nke Mu onwem nēnye unu ka ọ buru ihe-onwunwe, M'we tiye ihe-otiti ekpenta n'ulo ọ bula nke ala ahu, bú ihe-onwunwe-unu; 35 onye nwe ulo ahu gābia kwa, gosi onye-nchu-àjà, si, Emewom ka m'hu ihe dika ihe-otiti n'ulo: 36 onye-nchu-aja gēnye kwa iwu ka akwapu ihe di n'ulo ahu, tutu onye-nchu-àjà abà nime ihu ihe-otiti ahu, ka aghara ime ka ihe nile nke di n'ulo ru árú: emesia onye-nchu-àjà gābà kwa ihu ulo ahu: 37 ọ gāhu kwa ihe-otiti ahu anya, ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu di na mb͕idi ulo, nēnwe okokoro nke nācha akwukwọ ndu akwukwọ ndu ma-ọbu ọbara-ọbara, ọ buru kwa na ha di ala kari mb͕idi ahu, n'ile anya; 38 onye-nchu-àjà gēsi kwa n'ulo ahu pua rue ọnu-uzọ ulo ahu, mechi kwa ulo ahu ubọchi asa: 39 onye-nchu-àjà gābiaghachi n'ubọchi nke-asa, le kwa anya: ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu aba aba na mb͕idi ulo; 40 onye-nchu-àjà gēnye kwa iwu ka ha dọpu nkume nile nke ihe-otiti ahu di nime ha, tubà ha n'azu obodo, n'ebe ruru árú: 41 ọ gēme kwa ka akpucha ulo ahu nime buruburu, ha gāwusi kwa ájá nke ha kpuchapuru n'azu obodo, n'ebe ruru árú: 42 ha gēweta kwa nkume ọzọ, me ka ha ba n'ọnọdu nkume ahu: ájá ọzọ ka ọ gēwere kwa, te ulo ahu. 43 Ma ọ buru na ihe-otiti ahu alaghachi, b͕awaputa n'ulo ahu, mb͕e ọ dọpusiri nkume ahu, mb͕e ọ kpuchasi-kwa-ra ulo ahu, mb͕e etesi-kwa-ra ya; 44 onye-nchu-àjà gābata kwa, le anya, ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu abawo aba n'ulo, ekpenta jọb͕uru onwe-ya ka ọ bu nke di n'ulo: ihe ruru árú ka ọ bu 45 Ọ gākwatu kwa ulo ahu, bú nkume-ya nile, na osisi-ya nile, na ájá nile nke ulo ahu: o gēbupu kwa ha je n'azu obodo, n'ebe ruru árú. 46 Ọzọ, onye nābà n'ulo ahu ubọchi nile o mechiri ya gāru árú rue anyasi. 47 Onye nēdina kwa n'ulo ahu gāsu uwe-ya nile; ọzọ, onye nēri ihe n'ulo ahu gāsu uwe-ya nile. 48 Ma ọ buru na onye-nchu-àjà abata nime, le anya, ma, le, ihe-otiti ahu abaghi aba n'ulo ahu, mb͕e etesiri ulo ahu; onye-nchu-àjà gāsi kwa na ulo ahu di ọcha, n'ihi na emewo ka ihe-otiti ahu la. 49 Ọ gēwere kwa nnunu abua, na osisi cedar, na ogho uhie, na hyssop, iwepu nmehie n'ulo ahu: 50 ọ gēb͕u kwa otù nime nnunu ahu n'ihe ájá n'elu miri nērù erù: 51 ọ gēwere kwa osisi cedar ahu, na hyssop ahu, na ogho uhie ahu, na nnunu ahu di ndu, sue ha nime ọbara nnunu ahu eb͕uru eb͕u na nime miri ahu nērù erù, fesa kwa ulo ahu ub͕ò asa: 52 Ọ gēwepu kwa nmehie n'ulo ahu site n'ọbara nnunu ahu, site kwa na miri ahu nērù erù, site kwa na nnunu ahu di ndu, site kwa n'osisi cedar ahu, site kwa na hyssop ahu, site kwa n'ogho uhie ahu: 53 ma ọ gēzilaga nnunu ahu di ndu n'azu obodo n'ọhia sara iru: ọ gēkpuchi-kwa-ra ulo ahu nmehie-ya: ọ gādi kwa ọcha. 54 Nka bu iwu diri ihe-otiti ekpenta ọ bula, di-kwa-ra ọria-isi; 55 di-kwa-ra ekpenta uwe, di-kwa-ra ulo; 56 di-kwa-ra ihe-otutó, di-kwa-ra ọnyá, di-kwa-ra ntupọ nēke uke: 57 izi ihe n'ubochi nke iru-árú-ya na n'ubọchi nke idi-ọcha-ya: nka bu iwu ekpenta.

Levitikọs 15

1 Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si, 2 Gwanu umu Israel okwu, si ha, Nwoke ọ bula, mb͕e orùrù di sitere n'anu-aru-ya, n'ihi orùrù-ya onye ruru árú ka ọ bu. 3 Nka gābu kwa ọrurú n'orùrù-ya: ma ọ bu na anu-aru-ya nērù n'orùrù-ya, ma ọ bu na eb͕ochiwo anu-aru-ya n'orùrù-ya, orurú-ya ka ọ bu. 4 Ihe-ndina ọ bula nke onye nwere orùrù ahu nēdinakwasi gāru árú: ihe ọ bula kwa nke ọ nānọkwasi gāru árú. 5 Onye ọ bula nke nēmetu ihe-ndina-ya aru gāsu uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi. 6 Onye nānọkwasi n'ihe nke onye nwere orùrù nānọkwasi gāsu kwa uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi. 7 Onye nēmetu anu-aru nke onye ahu nwere orùrù gāsu kwa uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi. 8 Ọzọ, mb͕e onye nwere orùrù gābusa onye di ọcha ọnu-miri: ọ gāsu kwa uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi. 9 Ihe ọ bula eji anọkwasi anumanu nke onye nwere orùrù nānọkwasi gāru kwa árú. 10 Onye ọ bula nke nēmetu ihe ọ bula di n'okpuru ya aru gāru árú rue anyasi: onye nēbu kwa ha gāsu uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi. 11 Onye ọ bula nke onye nwere orùrù nēmetu aka, mb͕e ọ nāṅachaghi aka-ya abua na miri, ọ gāsu kwa uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi. 12 Ihe ájá kwa, nke onye nwere orùrù nēmetu aru, agētiwa ya: ihe osisi ọ bula kwa, agāṅacha ya na miri. 13 Ma mb͕e emeworo onye nwere orùrù ka ọ di ọcha site n'orùrù-ya, ọ gāgu-kwa-ra onwe-ya ubọchi asa ime ka ọ di ọcha, ọ gāsu kwa uwe-ya nile: ọ gāsa kwa anu-aru-ya nime miri nērù erù, ọ gādi kwa ọcha. 14 Ma n'ubọchi nke-asatọ ọ gēwere n'onwe-ya nduru abua, ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua, bia n'iru Jehova rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, nye ha onye-nchu-àjà: 15 onye-nchu-àjà gēme kwa ha, otù ka ọ buru àjà-nmehie, ibe-ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku; onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya n'iru Jehova n'ihi orùrù-ya. 16 Nwoke ọ bula, mb͕e ure-ya gēsi n'aru-ya pua, ọ gēwere kwa miri sa anu-aru-ya nile, ọ gāru kwa árú rue anyasi. 17 Uwe ọ bula, ma-ọbu akpukpọ ọ bula, nke ure dikwasi ya, agāsu ya na miri, ọ gāru kwa árú rue anyasi. 18 Nwayi kwa, onye nwoke nēdinayere, nke ọ rara aru n'aru-ya, ha abua gēwere miri sa aru-ha, ha gāru kwa árú rue anyasi. 19 Ọzọ, nwayi, mb͕e ọ nwere orùrù, ma orùrù-ya nke di n'anu-aru-ya bu ọbara ubọchi asa ka ọ gānọ n'idi-na-nsọ-ya: onye ọ bula nke nēmetu ya aru gāru kwa árú rue anyasi. 20 Ihe ọ bula nke o nēdinakwasi n'idi-na-nsọ-ya gāru kwa árú: ihe ọ bula kwa nke ọ nānọkwasi gāru árú. 21 Onye ọ bula nke nēmetu ihe-ndina-ya aru gāsu uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi. 22 Onye ọ bula nke nēmetu ihe ọ bula ọ nānọkwasi aru gāsu kwa uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi. 23 Ọ buru kwa na ọ bu n'ihe-ndina ka ọ dikwasi, ma-ọbu n'ihe nke ya onwe-ya nānọkwasi, mb͕e ọ nēmetu ya aru, ọ gāru árú rue anyasi. 24 Ọ buru kwa na ya nwoke edina ma-ọli, idi-na-nsọ-ya adikwasi n'aru nwoke ahu, ọ gāru árú ubọchi asa; ihe-ndina ọ bula nke o nēdinakwasi gāru kwa árú. 25 Nwayi ọ bula kwa, mbe o nwere orùrù-ọbara nēru ọtutu ubọchi, ma ọ dighi na mb͕e idi-na-nsọ-ya, ma-ọbu mb͕e ọ nwere orùrù gabiga mb͕e idi-na-nsọ-ya; ubọchi nile nke orúrú nke ọrurú-ya ọ gādi ka ubọchi idi-na-nsọ-ya; onye ruru árú ka ọ bu. 26 Ihe-ndina ọ bula nke o nēdinakwasi ubọchi nile nke orùrù-ya gādi ya ka ihe-ndina idi-na-nsọ-ya: ihe ọ bula nke ọ nānọkwasi gāru kwa árú, dika ọrurú idi-na-nsọ-ya. 27 Onye ọ bula nke nēmetu ha aru gāru kwa árú, ọ gāsu kwa uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi. 28 Ma ọ buru na emewo ka nwayi ahu di ọcha site n'orùrù-ya, ọ gāgu-kwa-ra onwe-ya ubọchi asa, emesi kwa ọ gādi ọcha. 29 N'ubọchi nke-asatọ ọ gēwere n'onwe-ya nduru abua, ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua, wetara ha onye-nchu-àjà, rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute. 30 Onye-nchu-àjà gēme kwa otù nime ha ka ọ buru àjà-nmehie, me kwa ibe-ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku; onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya n'iru Jehova n'ihi orùrù nke ọrurú-ya. 31 Unu gēkewapu kwa umu Israel n'ọrurú-ha; ka ha we ghara inwu n'ọrurú-ha, mb͕e ha meruru ebe-obibim nke di n'etiti ha. 32 Nka bu iwu nke onye nwere orùrù, na nke onye ure-ya si n'aru-ya pua, imeru ya nime ya; 33 na nke nwayi nke aru nādighi ya ike n'idi-na-nsọ-ya, na nke onye nwere orùrù, bú orùrù nke nwoke ma-ọbu nke nwayi, na nke nwoke nke ya na nwayi ruru árú nēdina.

Levitikọs 16

1 Jehova we gwa Moses okwu, mb͕e umu-ndikom abua nke Eron nwusiri, mb͕e ha biaruru nso n'iru Jehova, we nwua; 2 Jehova we si Moses, Gwa Eron, bú nwa-nne-gi, okwu, ka ọ ghara ibata mb͕e nile n'ebe nsọ a nime ákwà-nb͕ochi, n'iru ebe-nkpuchi-nmehie nke di n'elu ib͕e ahu; ka ọ we ghara inwu: n'ihi na nime igwe-oji ka agāhum n'elu ebe-nkpuchi-nmehie. 3 Nka ka Eron gēwere bata n'ebe nsọ a: ọ gēwere nwa-oke-ehi ka ọ buru àjà-nmehie, na ebulu ka ọ buru àjà-nsure-ọku. 4 Uwe-ime di nsọ nke ákwà ọcha ka o gēyiri, uwe-ukwu nke ákwà ọcha gādikwasi kwa n'anu-aru-ya, agēwere kwa ihe ike n'úkwù nke ákwà ọcha ke ya, akwa nkechi nke ákwà ọcha ka agēkpukwasi kwa ya: uwe nsọ ka ha bu; ọ gēwere kwa miri sa anu-aru-ya, we yiri ha. 5 N'aka nzukọ umu Israel ka ọ gānara kwa nkpi abua ka ha buru àjà-nmehie, na otù ebulu ka ọ buru àjà-nsure-ọku. 6 Eron gēweta kwa nso oké-ehi àjà-nmehie ahu, nke diri ya onwe-ya, ọ gēkpuchiri onwe-ya, kpuchi-kwa-ra ulo-ya, nmehie-ha. 7 Ọ gēwere kwa nkpi abua ahu, guzo ha n'iru Jehova n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute. 8 Eron gēfe kwa nzà n'elu nkpi abua ahu; otù nzà diri Jehova, otù nzà di-kwa-ra ewu-ọpupu. 9 Eron gēweta kwa nso nkpi ahu nke nzà nke diri Jehova mara, ọ gēme kwa ya ka ọ buru àjà-nmehie. 10 Ma nkpi ahu, nke nzà nke diri ewu-ọpupu mara, agēguzo ya na ndu n'iru Jehova, ikpuchi nmehie n'elu ya, izilaga ya n'ọzara ka ọ buru ewu-ọpupu. 11 Eron gēweta kwa nso oke-ehi àjà-nmehie ahu, nke diri ya onwe-ya, o gēkpuchiri onwe-ya, kpuchi-kwa-ra ulo-ya, nmehie-ha, o gēb͕u kwa oke-ehi àjà-nmehie ahu nke diri ya onwe-ya: 12 ọ gēwere kwa ihe-igu-ọku juputara n'icheku-ọku site n'elu ebe-ichu-àjà, site n'iru Jehova, na nju aka-ya abua nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ nke eji uda utọ di iche iche me, bú nke esupiara esupia, ọ gēwebata ya nime ákwà-nb͕ochi: 13 ọ gētiye kwa ihe-nsure-ọku ahu nēsì ísì utọ n'elu ọku n'iru Jehova, ka anwuru-ọku nke ihe-nsure-ọku ahu nke nēsi ísì utọ we kpuchie ebe-nkpuchi-nmehie nke di n'elu ihe-àmà ahu, ka ọ we ghara inwu: 14 ọ gēwere kwa ufọdu nime ọbara oke-ehi ahu, were nkpisi-aka-ya fesa ya n'iru ebe-nkpuchi-nmehie chere iru n'Iru-anyanwu; ọ bu kwa n'iru ebe-nkpuchi-nmehie ahu ka ọ gēwere nkpisi-aka-ya fesa ufọdu nime ọbara ahu ub͕ò asa. 15 Ọ gēb͕u kwa nkpi àjà-nmehie ahu, nke diri ndim, webata ọbara-ya nime ákwà-nb͕ochi, were ọbara-ya me dika o were ọbara oke-ehi ahu me, fesa ya n'elu ebe-nkpuchi-nmehie, na n'iru ebe-nkpuchi-nmehie: 16 ọ gēkpuchi-kwa-ra ebe nsọ a nmehie-ya, n'ihi ọrurú nile nke umu Israel, na n'ihi njehie nile ha, bú nmehie-ha nile: otú a ka ọ gēme-kwa-ra ulo-ikwū nzute, nke nēbiyere ha n'etiti ọrurú nile ha. 17 Ọ dighi kwa madu ọ bula gānọ n'ulo-ikwū nzute mb͕e ọ nābà ikpuchi nmehie n'ebe nsọ a, rue mb͕e ọ putara, kpuchisi-kwa-ra onwe-ya, kpuchisi-kwa-ra ulo-ya, kpuchisi-kwa-ra nkpọkọta nile nke Israel, nmehie-ha. 18 Ọ gāpu kwa je n'ebe-ichu-àjà nke di n'iru Jehova, kpuchiere ya nmehie-ya; were kwa ufọdu nime ọbara oke-ehi ahu, na ufọdu nime ọbara nkpi ahu, tiye ya n'elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà buruburu. 19 Ọ gēwere kwa nkpisi-aka-ya fesa ufọdu nime ọbara ahu n'elu ya ub͕ò asa, me ya ka ọ di ọcha, do kwa ya nsọ site n'ọrurú nile nke umu Israel. 20 Mb͕e o kpuchibiri nmehie ebe nsọ a, na nke ulo-ikwū nzute, na nke ebe-ichu-àjà, ọ gēweta nso nkpi ahu di ndu: 21 Eron gēbikwasi kwa aka-ya abua n'isi nkpi ahu di ndu, kwuputa n'elu ya ajọ omume nile nke umu Israel, na njehie-ha nile, bú nmehie-ha nile; o gētiye kwa ha n'elu isi nkpi ahu, zilaga ya n'ọzara site n'aka nwoke jikere ejikere: 22 nkpi ahu gēbu kwa n'aru ya ajọ omume-ha nile rue ala nkewapu: o gēzilaga kwa nkpi ahu n'ọzara. 23 Eron gābata kwa n'ulo-ikwū nzute, yipu uwe ákwà ọcha ahu nile, nke o yiri mb͕e ọ batara n'ebe nsọ a, ọ gāwusa ha n'ebe ahu: 24 ọ gēwere kwa miri sa anu-aru-ya n'ebe di nsọ, o gēyiri kwa uwe-ya nile, puta, me àjà-nsure-ọku-ya na àjà-nsure-ọku nke ndim, kpuchiri onwe-ya, kpuchi-kwa-ra ndim, nmehie-ha. 25 Abuba àjà-nmehie ahu, o gēsure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà. 26 Onye nēzilaga nkpi ka ọ buru ewu-ọpupu gāsu uwe-ya nile, were kwa miri sa anu-aru-ya, emesia ọ gābata n'ọmuma-ulo-ikwū. 27 Oke-ehi àjà-nmehie ahu kwa, na nkpi àjà-nmehie ahu, nke ewebatara ọbara-ha ikpuchi nmehie n'ebe nsọ a, agēbupu ha je n'azu ọmuma-ulo-ikwū; ha gēsure kwa akpukpọ-ha na anu-ha na nsi-ha nime ọku. 28 Onye nēsure ha ọku gāsu uwe-ya nile, were kwa miri sa anu-aru-ya, emesia ọ gābata n'ọmuma-ulo-ikwū. 29 Ọ gābu-kwa-ra unu ukpuru ebighi-ebi: n'ọnwa nke-asa, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu, unu gēweda nkpuru-obi-unu n'ala, ghara kwa ije ozi ọ bula, ma ọ bu onye amuru n'ala, ma-ọbu ọbìa nke nọ dika ọbìa n'etiti unu: 30 n'ihi na n'ubọchi a ka agēkpuchiri unu nmehie-unu, ime ka unu di ọcha; site na nmehie nile unu ka unu gādi ọcha n'iru Jehova. 31 Ubọchi-izu-ike nke idebe-ubọchi-izu-ike ka ọ buru unu, unu gēweda kwa nkpuru-obi-unu n'ala: ọ bu ukpuru ebighi-ebi. 32 Onye-nchu-àjà ahu, nke agēte manu, nke agēmeju kwa aka-ya ibu onye-nchu-àjà n'ọnọdu nna-ya, ọ gēkpuchi nmehie, yiri kwa uwe ákwà ọcha ahu, bú uwe nsọ ahu: 33 o gēkpuchi kwa nmehie nke ebe nsọ a di nsọ, nmehie ulo-ikwū nzute na nke ebe-ichu-aja ka ọ gēkpuchi kwa: ọ gēkpuchi-kwa-ra ndi-nchu-àjà, kpuchi-kwa-ra ndi nile nke nkpọkọta a, nmehie-ha. 34 Nka gābu-kwa-ra unu ukpuru ebighi-ebi, ikpuchiri umu Israel nmehie nile ha otù ub͕ò n'arọ. Ọ we me dika Jehova nyere Moses iwu.

Levitikọs 17

1 Jehova we gwa Moses okwu, si, 2 Gwa Eron, gwa kwa umu-ya ndikom, gwa kwa umu Israel nile, okwu, si ha; Nka bu ihe nke Jehova nyeworo n'iwu, si, 3 Nwoke ọ bula nke ulo Israel, nke nēb͕u ehi, ma-ọbu nwa-aturu, ma-ọbu ewu, n'omuma-ulo-ikwū, ma ọbu nke nēb͕u ya n'azu ọmuma-ulo-ikwū, 4 ma ọ wetaghi ya n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, iweta ya nso ka ọ buru onyinye iji biaru nso Jehova n'iru ebe-obibi Jehova: ọbara ka agāguru nwoke ahu; ọbara ka ọ wusiworo; agēbipu kwa nwoke ahu n'etiti ndi-ya: 5 ka umu Israel we weta àjà nile ha, nke ha onwe-ha nāchu n'ọhia sara iru, ọbuná ka ha we wetara ha Jehova, rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, were ha biakute onye-nchu-àjà, chua ha ka ha buru ihe àjà nke àjà udo anāchuru Jehova. 6 Onye-nchu-àjà gāwusa ọbara-ha n'elu ebe-ichu-àjà nke Jehova n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, sure kwa abuba-ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ka ọ buru ihe ísì utọ anāchuru Jehova. 7 Ha agaghi-achu-kwa-ra nkpi àjà-ha ọzọ, nke ha onwe-ha so nākwa iko. Ukpuru ebighi-ebi ka nka gāburu ha rue ọb͕ọ-ha nile. 8 I gāsi kwa ha, Nwoke ọ bula nke sitere n'ulo Israel, ma-ọbu na ndi-ọbìa ndi nọ dika ọbìa n'etiti ha, nke nēsure àjà-nsure-ọku ma-ọbu àjà ọzọ, 9 ma ọ wetaghi ya n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute imere ya Jehova, agēbipu kwa nwoke ahu n'etiti umu-nna-ya. 10 Ọzọ, nwoke ọ bula nke sitere n'ulo Israel, ma-ọbu na ndi-ọbìa ndi nọ dika ọbìa n'etiti ha, nke nēri ọbara ọ bula; M'gēche kwa irum megide madu ahu nke nēri ọbara, M'gēbipu kwa ya n'etiti ndi-ya. 11 N'ihi na ndu nke anu-aru, n'ọbara ka ọ di: Mu onwem enyewo kwa unu ya n'elu ebe-ichu-àjà ikpuchiri nkpuru-obi-unu nmehie-ha n'ihi na ọbara ka ọ bu nke nēkpuchi nmehie nime nkpuru-obi. 12 N'ihi nka ka M'siri umu Israel, Ọ dighi madu ọ bula n'etiti unu gēri ọbara, ọbìa kwa, nke nọ dika ọbìa n'etiti unu, ọ gaghi-eri ọbara. 13 Ọzọ nwoke ọ bula nke sitere n'umu Israel, ma-ọbu na ndi-ọbìa ndi nọ dika ọbìa n'etiti ha, nke nāchu ntá ihe, ma ọ bu anu-ọhia ma-ọbu anu-ufe, nke anēri eri; ọ gāwusi kwa ọbara-ya, were ájá kpuchi ya. 14 N'ihi na ọ bu ndu nke anu-aru ọ bula; ọbara-ya, ya na ndu-ya bu otù: M'we si umu Israel, Unu erila ọbara anu-aru ọ bula: n'ihi na ndu nke anu-aru ọ bula, ọbara-ya ka ọ bu onye ọ bula nke nēri ya, agēbipu ya. 15 Madu ọ bula nke nēri ihe nwuru onye-ya, ma-ọbu ihe anu-ọhia dọb͕uru, n'etiti ndi amuru n'ala ma-ọbu n'etiti ndi-ọbìa, ọ gāsu uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi: ọ we di ọcha. 16 Ma ọ buru na ọ sughi ha, ọ buru kwa na ọ saghi anu-aru-ya, o gēbu kwa ajọ omume-ya.

Levitikọs 18

1 Jehova we gwa Moses okwu, si, 2 Gwa umu Israel okwu, si ha, Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu. 3 Unu emela dika omume ala Ijipt, nke unu biri nime ya: unu eme-kwa-la dika omume ala Kenean, nke Mu onwem nēme ka unu ba n'ebe ahu: unu ejeghari-kwa-la n'ukpuru nile ha. 4 Ikpém nile ka unu gēme, ọ bu kwa ukpurum nile ka unu gēdebe, ijeghari nime ha: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu. 5 Unu gēdebe kwa ukpurum nile na ikpém nile: nke madu gēme, di ndu nime ha: Mu onwem bu Jehova. 6 Nwoke ọ bula abiarula nso onye-aru-ya ọ bula, ikpughe ọtọ-ya: Mu onwem bu Jehova. 7 Ekpughela ọtọ nna-gi, bú ọtọ nne-gi: nne-gi ka ọ bu; ekpughela ọtọ-ya. 8 Ekpughela ọtọ nwunye nna-gi: ọtọ nna-gi ka ọ bu. 9 Ọtọ nwa-nne-gi nwayi, bú nwa nke nna-gi ma-ọbu nwa nke nne-gi, nke amuru n'ulo, ma-ọbu nke amuru n'èzí, ekpughela ọtọ-ha. 10 Ọtọ nwa-nwayi nke nwa-gi nwoke, ma-ọbu ọtọ nwa-nwayi nke nwa-gi nwayi, ekpughela ọtọ-ha: n'ihi na ọtọ-gi ka ọtọ-ha bu. 11 Ọtọ nwa-nwayi nke nwunye nna-gi, nke nna-gi muru, nwa-nne-gi nwayi ka ọ bu, ekpughela ọtọ-ya. 12 Ekpughela ọtọ nwa-nne-nwan yi nke nna-gi: onye-aru nna-gi ka ọ bu. 13 Ekpughela ọtọ nwa-nne-nwan yi nke nne-gi: n'ihi na onye-aru nne-gi ka ọ bu. 14 Ekpughela ọtọ nwa-nne-nwoke nke nna-gi, abiarula nwunye-ya nso: nwunye nwa-nne nna-gi ka ọ bu. 15 Ekpughela ọtọ nwunye nwa-gi: nwunye nwa-gi ka ọ bu; ekpughela ọtọ-ya. 16 Ekpughela ọtọ nwunye nwa-nne-gi: ọtọ nwa-nne-gi ka ọ bu. 17 Ekpughela ọtọ nwanyi na nwa ya nwanyi; ekurula nwa-nwanyi nke nwa-ya nwoke, ma-ọbu nwa-nwayi nke nwa ya nwanyi, ikpughe ọtọ-ya; ndi-aru ka ha bu: nzube ọjọ ka ọ bu. 18 Ekuru-kwa-la nwayi tiyere nwa-nne-ya nwayi, ikpab͕u ya, ikpughe ọtọ-ya, tiyere ya na ndu-ya. 19 Abiarula nso nwayi ikpughe ọtọ-ya n'idi-na-nsọ nke ọrurú-ya. 20 Gi na nwunye madu-ibe-gi edinala ka i ra aru n'aru-ya, iwere ya meru onwe-gi. 21 Enye-kwa-la onye ọ bula nime nkpuru-gi ime ka ha gabiga rue Molek, eme-kwa-la ka aha Chineke-gi ghara idi nsọ: Mu onwem bu Jehova. 22 Gi na nwoke edinala dika nwoke na nwayi nēdina ihe-árú ka ọ bu. 23 Gi na anumanu ọ bula edina-kwa-la ka i ra aru n'aru-ya, iwere ya meru onwe-gi: nwayi agaghi-eguzo kwa n'iru anumanu iso ya dina; ngwakọta ọjọ ka ọ bu. 24 Unu ewerela ihe ndia nile meru onwe-unu: n'ihi na ewere ihe ndia nile me ka mb͕a nile rua árú, bú ndi Mu onwem nāchupu n'iru unu: 25 ala ahu ru-kwa-ra árú: M'nēwere kwa ajọ emume-ya leta ya, ala ahu nāb͕ọputa kwa ndi bi nime ya. 26 Unu onwe-unu gēdebe kwa ukpurum nile na ikpém nile, ghara kwa ime ihe ọ bula nime ihe-árú ndia nile; ma ọ bu onye amuru n'ala, ma-ọbu ọbìa nke nọ dika ọbìa n'etiti unu: 27 (n'ihi na ihe-áru ndia nile ka ndikom nke ala ahu meworo, ndi nọ n'iru unu, ala ahu ru-kwa-ra árú; ) 28 ka ala ahu we ghara ib͕ọputa unu mb͕e unu nēmeru ya, dika ọ b͕ọputara mba ahu nke di n'iru unu. 29 N'ihi na onye ọ bula nke nēme ihe ọ bula nime ihe-árú ndia nile, agēbipu nkpuru-obi nile nēme ha n'etiti ndi-ha. 30 Unu gēdebe kwa ihe-ndebem, ka unu we ghara ime ihe ọ bula nime ukpuru ihe-árú ndia, nke anēmeri n'iru unu, ka unu we ghara kwa iwere ha meru onwe-unu: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

Levitikọs 19

1 Jehova we gwa Moses okwu, si, 2 Gwa nzukọ nile nke umu Israel okwu, si ha, Nsọ ka unu gādi: n'ihi na nsọ ka Mu onwem, bú Jehova, Chineke-unu, di. 3 Unu gātu egwu, onye ọ bula ọ tua egwu nne-ya na nna-ya, unu gēdebe kwa ubọchi-izu-ikem nile: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu. 4 Unu echela ihe-efu ọ bula iru, unu eme-kwa-lara onwe-unu chi ọ bula awuru awu: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu. 5 Ma mb͕e unu gāchuru Jehova àjà nké àjà-udo, unu gāchu ya ka unu we buru ihe nātọ utọ. 6 N'ubọchi unu churu ya ka agēri ya, ya na echi-ya: ma nke fọduru rue ubọchi nke-atọ, n'ọku ka agēsure ya. 7 Ma ọ buru na erie ya ma-ọli n'ubọchi nke-atọ, ihe-árú ka ọ bu; ọ gaghi-abu ihe nātọ utọ: 8 ma onye nēri ya gēbu ajọ omume-ya, n'ihi na ihe nsọ nke Jehova ka o meworo ka ọ ghara idi nsọ: aga ebipu kwa nkpuru-obi ahu n'etiti umu-nna-ya. 9 Ma mb͕e unu nēwe ihe-ubi nke ala-unu, ewesila ihe di n'akuku ubi-gi, achikọta-kwa-la ihe-nchikọta nke owuwe-ihe-ubi-gi fọduru 10 Atutukọ-kwa-la nkpuru ubi-vine-gi fọduru, achikota-kwa-la nkpuru dara ada n'ubi-vine-gi; ob͕eye na ọbìa ka i gārapuru ha: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu. 11 Unu ezula ori; unu aghọ-kwa-la aghughọ, unu ekwu-kwa-la okwu-ugha, otù n'ebe ibe-ya nọ. 12 Unu ewe-kwa-la aham ṅu iyi n'okwu-ugha, we me ka aha Chineke-gi ghara idi nsọ: Mu onwem bu Jehova. 13 Emeb͕ula madu-ibe-gi, anapu-kwa-la ya ihe n'ike: ugwọ-ọlu nke onye egoro ọlu agaghi-adigide n'aka-gi ogologo abali nile rue ututu. 14 Akọchala onye nti chiri, etiye-kwa-la ihe-isu-ngọngọ n'iru onye-ìsì, ma tua egwu Chineke-gi: Mu onwem bu Jehova. 15 Unu emela ajọ omume n'ikpé: ahụla onye nēnweghi ike ikpemara iru ọma, asọpuru-kwa-la iru nke onye uku: n'ezi omume ka i gēkpe madu-ibe-gi ikpe. 16 Ejegharila n'etiti umu-nna-gi dika onye nāb͕a àmà ọjọ: eguzola imegide ọbara madu-ibe-gi: Mu onwem bu Jehova. 17 Akpọla nwa-nne-gi asi n'obi-gi: i ghaghi ibara madu-ibe-gi nba, ghara ibu nmehie bayere ya. 18 Abọla ọ́bọ̀, edebe-kwa-la iwe megide umu ndi-gi, ma hu madu-ibe-gi n'anya dika onwe-gi: Mu onwem bu Jehova. 19 Unu gēdebe ukpurum nile. Emela ka anu-ulo-gi di iche iche nāb͕a onwe-ha: aghala uzọ nkpuru abua n'ubi-gi: uwe nke eji uzọ ihe abua kpakọta agaghi-abia n'aru-gi. 20 Ma mb͕e nwoke soro nwayi dina ka ọ ra aru n'aru-ya, ma nwayi ahu bu nwayi nēje ozi, nke nwoke kwere ilu, nke anāb͕aputaghi ma-ọli, nke anēmeghi kwa ka ọ nwere onwe-ya: nchọputa okwu ahu gādi; agaghi-eme ka ha nwua, n'ihi na emeghi ka nwayi ahu nwere onwe-ya. 21 O gēweta-kwa-ra Jehova àjà-ikpe-ọmuma-ya, rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, bú ebulu ibu àjà-ikpe-ọmuma. 22 Onye-nchu-àjà gēwere kwa ebulu àjà-ikpe-ọmuma ahu kpuchiri ya nmehie-ya n'iru Jehova bayere nmehie-ya nke o mehieworo: agāb͕aghara kwa ya nmehie-ya nke o mehieworo. 23 Ma mb͕e unu gābà n'ala ahu, mb͕e unu gākuwori osisi nile ọ bula ibu ihe-oriri, unu gāgu kwa nkpuru-ya n'ebighi-úgwù-ya: arọ atọ ka ọ gāburu unu ihe anēbighi úgwù; agaghi-eri ya. 24 Ma n'arọ nke-anọ nkpuru-ya nile gādi nsọ, otuto anēto Jehova. 25 Ma n'arọ nke-ise unu gēri nkpuru-ya, ka ọ we mikwasiri unu ihe ọmume-ya: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu. 26 Unu erila ihe ọ bula ya na ọbara-ya: unu ab͕ala afa, unu eji-kwa-la igwe-oji tu isi ọma ma-ọbu isi ọjọ. 27 Unu akọpula usọ isi-unu buruburu, ebibi-kwa-la usọ afu-ọnu-gi. 28 Unu eb͕ula eb͕ub͕u n'anu-aru-unu n'ihi nkpuru-obi madu, unu etiye-kwa-la ihe-odide, bú eb͕ub͕u-ọku, n'aru unu: Mu onwem bu Jehova. 29 Emela ka nwa-gi nwayi ghara idi nsọ, ime ka ọ ghọ nwayi nākwa iko; ka ala-gi we ghara ikwa iko, ka ala-gi we ghara kwa ijuputa na nzube ọjọ. 30 Unu gēdebe ubọchi-izu-ikem nile, tu kwa egwu ebe nsọm: Mu onwem bu Jehova. 31 Unu echela ndi nāju mọ ihe iru, unu eche-kwa-la ndi-dibia-afa iru; unu achọputala ha, iwere ha meru onwe-unu: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu. 32 I gēbili ọtọ n'iru onye-isi-awọ, sọpuru kwa iru okenye, tu kwa egwu Chineke-gi: Mu onwem bu Jehova. 33 Mb͕e ọbìa gānoyere gi dika ọbìa n'ala-unu, unu emela ya ihe-ike. 34 Dika onye amuru n'ala site n'aru unu ka ọbìa gādiri unu, bú onye nọ dika ọbìa n'etiti unu, i gāhu kwa ya n'anya dika onwe-gi; n'ihi na ndi-ọbìa ka unu buri n'ala Ijipt: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu. 35 Unu emela ajọ omume-n'ikpé, ma-ọbu n'itù ihe, ma-ọbu n'isi ihe, ma-ọbu n'itù ihe di miri miri. 36 Ihe-osìsì ziri ezi, na nkume isì-ihe ziri ezi na ephah ziri ezi, na hin ziri ezi, ka unu gēnwe: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Nke mere ka unu si n'ala Ijipt puta. 37 Unu gēdebe kwa ukpurum nile na ikpém nile, me kwa ha: Mu onwem bu Jehova.

Levitikọs 20

1 Jehova we gwa Moses okwu, si, 2 I gāsi kwa umu Israel, Nwoke ọ bula n'etiti umu Israel, ma-ọbu n'etiti ndi-ọbìa ndi nọ dika ọbìa n'Israel, nke nēnye Molek otù nwa nime nkpuru-ya: aghaghi ime ka ọ nwua: ndi ala-unu gēwere nkume tub͕ue ya. 3 Mu onwem gēche kwa irum megide nwoke ahu, bipu ya n'etiti ndi-ya; n'ihi na ufọdu nime nkpuru-ya ka o nyeworo Molek, ka o we meru ebe nsọm, na ime ka aha nsọm ghara idi nsọ. 4 Ma ọ buru na ndi ala-unu ezopu anya-ha n'aru nwoke ahu ma-ọli, mb͕e ọ nēnye Molek ufọdu nime nkpuru-ya, ha we ghara ime ka ọ nwua: 5 Mu onwem gēdo kwa irum megide nwoke ahu, megide kwa ab͕uru-ya, Mu onwem gēbipu kwa ya ndi-nile nēso ya kwa iko, bú iso Molek kwa iko, n'etiti ndi-ha. 6 Madu ahu kwa nke nēche ndi nāju mọ ihe iru, nke nēche kwa ndi-dibia-afa iru, iso ha kwa iko, M'gēdo irum megido madu ahu, bipu ya n'etiti ndi-ya. 7 Unu gēdo kwa onwe-unu nsọ we di nsọ; n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu. 8 Unu gēdebe ukpurum nile, me ha: Mu onwem bu Jehova nēdo unu nsọ. 9 N'ihi na onye ọ bula nke nākọcha nna-ya ma-ọbu nne-ya, aghaghi ime ka ọ nwua: nna-ya ma-ọbu nne-ya ka ọ kọchaworo; ọbara-ya gādikwasi ya. 10 Nwoke nke ya na nwunye nwoke ọzọ nākwa iko, bú onye ya na nwunye madu-ibe-ya nākwa iko, aghaghi ime ka ha nwua, bú nwoke ahu nākwa iko, na nwayi ahu nākwa iko. 11 Nwoke ọ bula nke ya na nwunye nna-ya nēdina, ọtọ nna-ya ka o kpugheworo: aghaghi ime ka ha abua nwua; ọbara-ha gādikwasi ha. 12 Nwoke ọ bula nke ya na nwunye nwa-ya nēdina, aghaghi ime ka ha abua nwua: ngwakọta ọjọ ka ha meworo; ọbara-ha gādikwasi ha. 13 Nwoke ọ bula nke ya na nwoke nēdina, dika nwoke na nwayi nēdina, ihe-árú ka ha abua meworo: aghaghi ime ka ha nwua; ọbara-ha gādikwasi ha. 14 Nwoke ọ bula nke nēkuru nwayi na nne-ya, nzube ọjọ ka ọ bu: n'ọku ka agēsure ha, ya na ha; ka nzube ọjọ we ghara idi n'etiti unu. 15 Nwoke ọ bula nke ya na anumanu nēdina ka ọ ra aru n'aru-ya, aghaghi ime ka ọ nwua: unu gēb͕u kwa anumanu ahu. 16 Nwayi ọ bula nke nābiaru nso anumanu ọ bula, iso ya dina, i gēb͕u nwayi ahu na anumanu ahu: aghaghi ime ka ha nwua; ọbara-ha gādikwasi ha. 17 Nwoke ọ bula nke nēkuru nwa-nne-ya nwayi, bú nwa-nwayi nna-ya, ma-ọbu nwa-nwayi nne-ya, we hu ọtọ-ya, nwayi ahu we hu ọtọ-ya; ihe-ihere ka ọ bu; agēbipu kwa ha n'anya umu ndi-ha: ọtọ nwa-nne-ya nwayi ka o kpugheworo; o gēbu ajọ omume-ya. 18 Nwoke ọ bula nke ya na nwayi nke nāsọ uba nēdina, nke gēkpughe kwa ọtọ-ya; isi ọbara nwayi ahu ka ọ b͕abaworo ọtọ, nwayi ahu ekpughewo kwa isi ọbara nke ya onwe-ya: agēbipu kwa ha abua n'etiti ndi-ya. 19 Ekpughela ọtọ nwa-nne-nwayi nke nne-gi, ma-ọbu ọtọ nke nwa-nne-nwayi nke nna-gi: n'ihi na onye-aru-ya ka ọ b͕abaworo ọtọ: ha gēbu ajọ omume-ha. 20 Nwoke ọ bula nke ya na nwunye nwa-nne nke nna-ya nēdina, ọtọ nwa-nne-nwoke nke nna-ya ka o kpugheworo: nmehie-ha ka ha gēbu; ha gāb͕a aka nwa nwua. 21 Nwoke ọ bula nke nēkuru nwunye nwa-nne-ya, ihe isọ nsọ ka ọ bu: ọtọ nwa-nne-ya nwoke ka o kpugheworo; ha gāb͕a aka nwa. 22 Unu gēdebe kwa ukpurum nile, na ikpém nile, me ha: ka ọ we ghara ibọputa unu, bú ala ahu nke Mu onwem nēme ka unu ba n'ebe ahu ibi nime ya. 23 Unu ejeghari-kwa-la n'ukpuru nile nke mba ahu, nke Mu onwem nāchupu n'iru unu: n'ihi na ihe ndia nile ka ha mere, ike ha we gwusiam. 24 Ma asim unu, Unu onwe-unu gēnweta ala-ha, Mu onwem gēnyekwara unu aka inweta ya, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù na ya: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Nke kpaworo ókè n'etiti unu na ndi nile ọzọ. 25 Unu gākpa kwa ókè n'etiti anumanu di ọcha na nke ruru árú, na n'etiti anu-ufe ruru árú na nke di ọcha: unu ewe-kwa-la anumanu me onwe-unu ihe-árú, ewe-kwa-la anu-ufe, ewe-kwa-la ihe ọ bula nākpu akpu n'ala, nke M'kpaworo ókè n'etiti unu na ya, ime ka ọ rua árú. 26 Unu gābu-kwa-ram ndi nsọ: n'ihi na nsọ ka Mu onwem, bú Jehova, di, akpawokwam ókè n'etiti unu na ndi nile ọzọ ka unu we buru nkem. 27 Ma nwoke ma-ọbu nwayi, mb͕e mọ anāju ihe di nime ha, ma-ọbu nke bu dibia afa, aghaghi ime ka ha nwua: nkume ka ha gēwere tub͕ue ha: ọbara-ha gādikwasi ha.

Levitikọs 21

1 Jehova we si Moses, Gwa ndi-nchu-àjà, bú umu-ndikom Eron, okwu, si ha, Onye-nchu-àjà agaghi-emeru onwe-ya n'ihi madu nwuru anwu n'etiti umu-nna-ya; 2 ma-ọbughi nání n'ihi onye-aru-ya, nke di ya nso, n'ihi nne-ya, na n'ihi nna-ya, na n'ihi nwa-ya nwoke, na n'ihi nwa-ya nwayi, na n'ihi nwa-nne-ya nwoke: 3 na n'ihi nwa-nne-ya nwayi, bú nwa-ab͕oghọ nāmaghi nwoke, nke di ya nso, nke ọ dighi mb͕e nwoke luru ya na nwunye, n'ihi ya ka ọ gēmeru onwe-ya. 4 Ọ gaghi-emeru onwe-ya, ime onwe-ya ka ọ ghara idi nsọ, ebe ọ bu onye-nwe madu n'etiti umu-nna-ya. 5 Ha agaghi-eme onwe-ha isi-nkwọcha n'isi-ha, ha agaghi-akọpu kwa usọ afu-ọnu-ha, ha agaghi-eb͕u kwa eb͕ub͕u n'anu-aru-ha. 6 Ndi nsọ ka ha gāburu Chineke-ha, ha agaghi-eme kwa ka aha Chineke-ha ghara idi nsọ: n'ihi na àjà-ọku Jehova, bú nri Chineke-ha, ka ha onwe-ha nēweta nso: ha gādi kwa nsọ. 7 Ha agaghi-aluru nwayi nākwa iko na nwunye, ma-ọbu nwayi nke emeworo ka ọ ghara idi nsọ; ha agaghi-alu kwa nwayi achupuru achupu n'aru di-ya: n'ihi na nsọ ka ọ di n'ebe Chineke-ya nọ. 8 I gēdo kwa ya nsọ; n'ihi na nri Chineke-gi ka ya onwe-ya nēweta nso: nsọ ka ọ gādi n'ebe i nọ: n'ihi na nsọ ka Mu onwem, bú Jehova, di, Nke nēdo gi nsọ. 9 Nwa-nwayi nke onye-nchu-aja ọ bula kwa, mb͕e ọ gēme onwe-ya ka ọ ghara idi nsọ site n'ikwa iko, nna-ya ka nwanyi ahu nēme ka ọ ghara idi nsọ: n'ọku ka agēsure ya. 10 Ma onye-nchu-àjà n'etiti umu-nna-ya, onye awukwasiworo manu nke otite-manu n'isi-ya, onye emejuwo-kwa-ra aka-ya iyiri uwe ahu, ọ gaghi-atọpu agiri-isi-ya, ọ gaghi-adọwa kwa uwe-ya; 11 ọ gaghi-abakuru kwa madu nwuru anwu, ọ gaghi-emeru kwa onwe-ya n'ihi nna-ya, ma-ọbu n'ihi nne-ya; 12 ọ gaghi-esi kwa n'ebe nsọm pua, ọ gaghi-eme kwa ka ebe nsọ Chineke-ya ghara idi nsọ; n'ihi na nkewapu nke manu nke otite-manu nke Chineke-ya dikwasi ya: Mu onwem bu Jehova. 13 Ya onwe-ya gāluru nwunye mb͕e ọ di na nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke. 14 Nwayi-di-ya nwuru, ma-ọbu nke achupuru achupu, ma-ọbu nke emere ka ọ ghara idi nsọ, bú nwayi nākwa iko, ndia ka ọ nāgaghi-aluru na nwunye: ma nwa-ab͕oghọ nāmaghi nwoke nke sitere n'umu-nna-ya ka ọ gāluru na nwunye. 15 Ọ gaghi-eme kwa ka nkpuru-ya ghara idi nsọ n'etiti umu-nna-ya: n'ihi na Mu onwem bu Jehova nēdo ya nsọ. 16 Jehova we gwa Moses okwu, si, 17 Gwa Eron okwu, si, Nwoke ọ bula nke nkpuru-gi rue ọb͕ọ-ha nile nke ọlu di n'aru ya, ya abiarula nso iweta nri Chineke-ya nso. 18 N'ihi na nwoke ọ bula nke ọlu di n'aru ya, ọ gaghi-abiaru nso: nwoke nke bu onye-ìsì, ma-ọbu onye-ngwurọ, ma-ọbu nke nwere imi-npia, ma-ọbu nke nwere n'aru-ya ihe ibe-ya nēnweghi, 19 ma-ọbu nwoke nke ukwu kpajiri, akpaji, ma-ọbu aka kpajiri akpaji, di n'aru ya, 20 ma-ọbu onye-nkpunkpu-azu, ma-ọbu onye-ùkpọ̀, ma-ọbu nke nwere ntupọ n'anya-ya, ma-ọbu nke àb͕à nāta, ma-ọbu nke nwere ire-ebube, ma-ọbu nke nkpuru-amu-ya chipiara echipia; 21 ọ dighi nwoke ọ bula nke nkpuru Eron onye-nchu-àjà, nke ọlu di n'aru ya, gābiaru nso iweta àjà-ọku Jehova nso: ọlu di n'aru ya; ọ gaghi-abiaru nso iweta nri Chineke-ya nso. 22 Nri Chineke-ya, nke sitere n'ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile, na n'ihe nsọ nile, ka o gēri. 23 Nání na ọ gaghabà rue ákwà-nb͕ochim, ọ gaghi-abiaru kwa nso ebe-ichu-àjàm, n'ihi na ọlu di n'aru ya; ka ọ we ghara ime ka ebe nsọm nile ghara idi nsọ: n'ihi na Mu onwem bu Jehova nēdo ha nsọ. 24 Moses we gwa Eron, gwa kwa umu-ya ndikom, gwa kwa umu Israel nile, okwu.

Levitikọs 22

1 Jehova we gwa Moses okwu, si, 2 Gwa Eron na umu-ya ndikom okwu, ka ha kewapu onwe-ha n'ihe nsọ nile nke umu Israel, nke ndi ahu nēdorom nsọ, ka ha ghara kwa ime ka aha nsọm ghara idi nsọ: Mu onwem bu Jehova. 3 Si ha, Nwoke ọ bula nke nkpuru-unu nile rue ọb͕ọ-unu nile, nke nābiaru nso ihe nsọ nile, nke umu Israel nēdoro Jehova nsọ, ma orurú-ya di n'aru ya, agēbipu madu ahu n'irum: Mu onwem bu Jehova. 4 Nwoke ọ bula nke nkpuru Eron nke bu onye-ekpenta, ma-ọbu nke nwere orùrù; ọ gaghi-eri ihe ọ bula nime ihe nsọ nile, rue mb͕e ọ di ọcha. Ọzọ, onye nēmetu ihe ọ bula ruru árú nke madu nwuru anwu aru, ma-ọbu nwoke nke ure-ya nēsi n'aru-ya pua; 5 ma-ọbu nwoke nke nēmetu ihe ọ bula nēnuputa enuputa aru, nke ruru árú n'ebe ọ nọ ma-ọbu nke nēmetu nwoke nke ruru árú n'ebe ọ nọ aru, ọbuná ọrurú-ya ọ bula; 6 madu nke nēmetu ya aru gāru árú rue anyasi, ọ gagheri kwa ihe ọ bula nime ihe nsọ nile, ma ọ buru na ọ saghi anu-aru-ya na miri. 7 Ma mb͕e anyanwu daworo, ọ gādi ọcha; emesia ọ gēri ihe ufọdu nime ihe nsọ nile, n'ihi na nri-ya ka ọ bu. 8 Ihe nwuru onwe-ya, ma-ọbu ihe anu-ọhia dọb͕uru, ọ gaghi-eri ya, iwere ya meru onwe-ya: Mu onwem bu Jehova. 9 Ha gēdebe kwa ihe-ndebem, ka ha we ghara ibū nmehie bayere ya, nwua nime ya, mb͕e ha nēme ya ka ọ ghara idi nsọ: Mu onwem bu Jehova nēdo ha nsọ. 10 Ọ dighi onye ala ọzọ ọ bula gēri ihe nsọ ahu: onye nānọdu n'ulo onye-nchu-àjà, ma-ọbu onye egoro ọlu agaghi-eri ihe nsọ ahu. 11 Ma mb͕e onye-nchu-àjà gāb͕ata madu, bú onye o ji ego-ya b͕ata, onye ahu gēri ufọdu nime ya; ya na onye amuru n'ulo-ya, ndi ahu gēri ufọdu nime nri-ya. 12 Ma nwa-nwanyi onye-nchu-àjà, mb͕e onye ala ọzọ nwere ya na nwunye, nwayi ahu agaghi-eri ihe ọ bula nime àjà-nbuli nke ihe nsọ nile. 13 Ma nwa-nwanyi onye-nchu-àjà, mb͕e ọ bu nwanyi di-ya nwuru, ma-ọbu nwanyi achupuru achupu, ma o nweghi nkpuru, o we laghachi n'ulo nna-ya, dika mb͕e ọ di na nwata, ihe nime nri nna-ya ka o gēri: ma ọ dighi onye ala ọzọ ọ bula gēri ihe ọ bula nime ya. 14 Ma mb͕e onye ọ bula gēri ihe nsọ n'amaghi-ama, ọ gātukwasi kwa otù uzọ n'uzo ise ya n'elu ya, nye onye-nchu-àjà ihe nsọ ahu. 15 Ha agaghi-eme kwa ka ihe nsọ nke umu Israel ghara idi nsọ, bú nke ha nēbuliri Jehova; 16 ha we ghara ime ka ha nēbu ajọ omume nke ikpe-ọmuma, mb͕e ha nēri ihe nsọ ha: n'ihi na Mu onwem bu Jehova nēdo ha nsọ. 17 Jehova we gwa Moses okwu, si, 18 Gwa Eron, gwa kwa umu-ya ndikom, gwa kwa umu Israel nile, okwu, si ha, Nwoke ọ bula nke sitere n'ulo Israel, ma-ọbu na ndi-ọbìa n'Israel, nke nēweta nso onyinye-ya iji biaru nso, bú nke diri nkwa-ha nile, ma-ọbu nke diri onyinye-afọ-ofufo-ha nile, nke ha nēweta nso Jehova ka ọ buru àjà-nsure-ọku; 19 unu gēweta nso oké nke zuru okè n'etiti ìgwè ehi, ma-ọbu n'etiti aturu, ma-ọbu n'etiti ewu, ka unu we buru ihe nātọ utọ. 20 Ihe ọ bula nke ọlu di n'aru ya, unu ewetala ya nso: n'ihi na ọ gaghi-abu ihe nātọ utọ n'ọnọdu unu. 21 Ọzọ mb͕e onye ọ bula nēweta nso Jehova ihe àjà nke àjà-udo imezu nkwa, ma-ọbu inye onyinye-afọ-ofufo, n'etiti ìgwè ehi ma-ọbu n'etiti ìgwè ewu na aruru, ihe zuru okè ka ọ gābu ibu ihe nātọ utọ: ọlu ọ bula agaghi-adi n'aru ya. 22 Ihe kpuru ìsì, ma-ọbu ihe kpajiri akpaji, ma-ọbu ihe emeruru aru, ma-ọbu ihe nwere ọnyá, ma-ọbu ihe àb͕à nāta, ma-ọbu ihe nwere ire-ebube, unu ewetala ndia nso Jehova, unu esite-kwa-la na ha chuara Jehova àjà-ọku n'elu ebe-ichu-àjà-Ya. 23 Oke-ehi ma-ọbu nwa-aturu nke nwere n'aru-ya ihe ibe-ya nēnweghi, ma-ọbu nke kpọrọ ùkpọ̀, onyinye-afọ-ofufo ka i gēme ya; ma ọ gaghi-abu ihe nātọ utọ bayere nkwa. 24 Ihe nke nkpuru-amu-ya chipiara echipia, ma-ọbu nke piara apia, ma-ọbu nke adọwapuru adọwapu, ma-ọbu nke ebipuru ebipu, unu ewetala ya nso Jehova: unu eme-kwa-la otú a n'ala-unu. 25 Unu esite-kwa-la n'aka onye ala ọzọ weta nso nri Chineke-unu site n'ihe ndia nile; n'ihi na nbibi-ha di nime ha, ọlu di n'aru ha: ha agaghi-abu ihe nātọ utọ n'ọnọdu unu. 26 Jehova we gwa Moses okwu, si, 27 Oke-ehi, ma-ọbu aturu, ma-ọbu ewu, mb͕e amuru ya, ọ gādi kwa n'okpuru nne-ya ubọchi asa; ma site n'ubọchi nke-asatọ we gaba ọ gābu ihe nātọ utọ ibu onyinye iji biaru nso nke àjà-ọku anāchuru Jehova. 28 Ehi ma-ọbu aturu, unu eb͕ula ya na nwa-ya n'otù ubọchi. 29 Ma mb͕e unu gāchuru Jehova àjà-ekele, unu gāchu ya ka unu we buru ihe nātọ utọ. 30 N'otù ubọchi ahu ka agēri ya; unu emela ka ihe fọdu nime ya rue ututu: Mu onwem bu Jehova. 31 Unu gēdebe kwa ihe nile M'nyere n'iwu, unu gēme kwa ha: Mu onwem bu Jehova. 32 Unu eme-kwa-la ka aha nsọm ghara idi nsọ; ma agēdom nsọ n'etiti umu Israel: Mu onwem bu Jehova nēdo unu nsọ, 33 Nke nēme ka unu si n'ala Ijipt puta, ka M'we buru unu Chineke: Mu onwem bu Jehova.

Levitikọs 23

1 Jehova we gwa Moses okwu, si, 2 Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e nile akara àkà nke Jehova, nke unu gākpọsa ha, ka ha buru nkpọkọta nsọ, ndia bu mb͕em akara àkà. 3 Ubọchi isi ka agēje ozi: ma n'ubọchi nke-asa, ubọchi-izu-ike nke idebe-ubọchi-izu-ike gādi, bú nkpọkọta nsọ: ọ dighi ozi ọ bula unu gēje: ubọchi-izu-ike nke Jehova nwere ka ọ bu n'ebe-obibi-unu nile. 4 Ndia bu mb͕e akara àkà nke Jehova, bú nkpọkọta nsọ, nke unu gākpọsa na mb͕e-ha akara àkà. 5 N'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu n'etiti ehihie na anyasi, ka ngabiga nke diri Jehova gādi. 6 N'ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa ahu ka ememe achicha ekoghi-eko gādi-kwa-ra Jehova: ubọchi asa ka unu gēri achicha ekoghi-eko. 7 N'ubọchi mbu unu gēnwe nkpọkọta nsọ: ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje. 8 Ma unu gēweta nso àjà-ọku anāchuru Jehova ubọchi asa: n'ubọchi nke-asa nkpọkọta nsọ gādi; ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje. 9 Jehova we gwa Moses okwu, si, 10 Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e unu bara n'ala nke Mu onwem nēnye unu, mb͕e unu gēwe kwa ihe-ubi-ya, unu gēweta-kwa-ra onye-nchu-àjà ùkwù nke ihe mbu nke owuwu-ihe-ubi-unu: 11 ọ gēfé kwa ùkwù ahu n'iru Jehova, ka unu we buru ihe nātọ utọ: n'echi nke ubọchi-izu-ike ahu ka onye-nchu-àjà gēfé ya. 12 N'ubọchi unu nēfé ùkwù ahu, unu gēme nwa-ebulu nke zuru okè nke b͕ara otù arọ ka ọ buru àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova. 13 Onyinye-inata-iru-ọma-ya gābu uzọ abua n'uzọ iri nke ephah utu ọka flour agwara manu, bú àjà-ọku anāchuru Jehova ibu ísì utọ: àjà-ihe-ọṅuṅu-ya gābu kwa manya-vine, otù uzọ n'uzọ anọ nke hin. 14 Unu eri-kwa-la achicha, ma-ọbu ọka aṅara aṅa, ma-ọbu ọka rara oko, rue otù ubọchi a, rue mb͕e unu wetara onyinye iji biaru nso nke Chineke-unu: ọ bu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile n'ebe-obibi-unu nile. 15 Unu gāgu-kwa-ra onwe-unu site n'echi nke ubọchi-izu-ike ahu, site n'ubọchi unu butere ùkwù nke àjà-ofufé; ubọchi-izu-ike asa zuru okè gādi: 16 rue echi nke ubọchi-izu-ike nke-asa ka unu gāgu ọgu ubọchi abua na iri, unu gēweta kwa nso Jehova onyinye-inata-iru-ọma ọhu. 17 Unu gēsite n'ebe-obibi-unu weta ob͕e achicha abua nke àjà-ofufé, nke uzọ abua n'uzọ iri nke ephah: utu ọka flour ka ha gābu, ihe nēko achicha ka agēji si ha, iburu Jehova nkpuru mbu. 18 Unu gēweta kwa nso umu-aturu asa ndi zuru okè nke b͕ara otù arọ, na otù nwa-oke-ehi, na ebulu abua, tiyere achicha ahu: ha gābu àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova, ha na onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ha, bú àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova. 19 Unu gēme kwa otù nkpi ka ọ buru àjà-nmehie, me kwa umu-ebulu abua nke b͕ara otù arọ ka ha buru ihe àjà nke àjà-udo. 20 Onye-nchu-àjà gēfé kwa ha tiyere achicha nke nkpuru mbu ka ha buru àjà-ofufé n'iru Jehova tiyere umu-aturu abua ahu: nsọ ka ha gādiri Jehova n'ebe onye-nchu-àjà nọ. 21 Unu gākpọsa kwa òkù n'otù ubọchi ahu; nkpọkọta nsọ gādiri unu: ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje: ukpuru ebighi-ebi ka ọ bu n'ebe-obibi-unu nile rue ọbọ-unu nile. 22 Mb͕e unu nēwe ihe-ubi nke ala-unu ewesila ihe di n'akuku ubi-gi mb͕e i nēwe ihe-ubi-gi, achikọta-kwa-la ihe-nchikọta nke owuwe-ihe-ubi-gi fọduru: ob͕eye na ọbìa ka i gārapuru ha: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu. 23 Jehova we gwa Moses okwu, si, 24 Gwa umu Israel okwu, si, N'ọnwa nke-asa, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, idebe-ubọchi-izu-ike gādiri unu, ncheta nke uda-opì nādasi ike, nkpọkọta nsọ. 25 Ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje: unu gēweta kwa nso àjà-ọku ichuru Jehova. 26 Jehova we gwa Moses okwu, si, 27 Otú ọ di, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa nke-asa nka ka ubọchi nkpuchi-nmehie gādi: nkpọkọta nsọ ka ọ gāburu unu, unu gēweda kwa nkpuru-obi-unu n'ala; unu gēweta kwa nso àjà-ọku ichuru Jehova. 28 Ọ dighi kwa ozi ọ bula unu gēje n'otu ubọchi ahu: n'ihi na ubọchi nkpuchi-nmehie ka ọ bu, ikpuchiri unu nmehie-unu n'iru Jehova, bú Chineke-unu. 29 N'ihi na madu ọ bula nke anewedaghi n'ala n'otù ubọchi ahu, agēbipu ya n'etiti umu-nna-ya. 30 Ma madu ọ bula nke nēje ozi ọ bula n'otù ubọchi ahu, M'gēme ka madu ahu si n'etiti ndi-ya la n'iyì. 31 Ọ dighi ozi ọ bula unu gēje: ọ bu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile n'ebe-obibi-unu nile. 32 Ubọchi-izu-ike nke idebe-ubọchi-izu-ike ka ọ gāburu unu, unu gēweda kwa nkpuru-obi-unu n'ala: n'ubọchi nke-iteghete nke ọnwa n'anyasi, site n'anyasi rue anyasi, ka unu gēdebe ubọchi-izu-ike-unu. 33 Jehova we gwa Moses okwu, si, 34 Gwa umu Israel okwu, si, N'ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa nke-asa nka ka ememe ulo-ntu gādiri Jehova ubọchi asa. 35 N'ubọchi mbu nkpọkọta nsọ gādi: ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje. 36 Ubọchi asa unu gēweta nso àjà-ọku ichuru Jehova: n'ubọchi nke-asatọ nkpọkọta nsọ gādiri unu; unu gēweta kwa nso àjà-ọku ichuru Jehova: ubọchi nb͕ochi ka ọ bu; ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje. 37 Ndia bu mb͕e akara àkà nke Jehova, nke unu gākpọsa, ka ha buru nkpọkọta nsọ, iweta nso àjà-ọku anāchuru Jehova, bú àjà-nsure-ọku, na onyinye-inata-iru-ọma, àjà-ihe-ọṅuṅu, ihe nke ubọchi n'ubọchi-ya: 38 nāgughi ubọchi-izu-ike nile nke Jehova, nāgughi kwa onyinye nile unu, nāgughi kwa nkwa-unu nile, nāgughi kwa onyinye-afọ-ofufo-unu nile, nke unu nēnye Jehova. 39 Otú ọ di, n'ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa nke-asa ahu, mb͕e unu chikọtasiri ihe-ọmume nke ala ahu, unu gēme ememe Jehova ubọchi asa: n'ubọchi mbu idebe-ubọchi-izu-ike gādi, n'ubọchi nke-asatọ idebe-ubọchi-izu-ike gādi kwa. 40 Unu gāchiri kwa n'onwe-unu n'ubọchi mbu nkpuru nke osisi ọma, na igu nkwu, na alaka osisi b͕ara ọhia, na osisi willow nke miri-iyi; unu gaṅuri kwa ọṅu n'iru Jehova, bú Chineke-unu, ubọchi asa. 41 Unu gēme kwa ya dika ememe emere Jehova ubọchi asa n'arọ: ọ bu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile: n'ọnwa nke-asa ka unu gēme ya. 42 N'ulo-ntu ka unu gēbi ubọchi asa; ndi nile amuru n'ala n'Israel gēbi n'ulo-ntu: 43 ka ọb͕ọ-unu nile we mara na ọ bu n'ulo-ntu ka M'mere umu Israel ka ha biri, mb͕e M'mere ka ha si n'ala Ijipt puta: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu. 44 Moses we gwa umu Israel mb͕e nile akara àkà nke Jehova.

Levitikọs 24

1 Jehova we gwa Moses okwu, si, 2 Nye umu Israel iwu, ka ha wetara gi manu olive anāgwaghi agwa nke asuru asu, itiye n'ihe nēnye ìhè, iweli oriọna mb͕e dum. 3 N'èzí ákwà-nb͕ochi nke ihe-àmà, n'ulo-ikwū nzute, ka Eron gēdo ya n'usoro site n'anyasi rue ututu n'iru Jehova mb͕e dum: ọ gābu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile. 4 N'elu ihe-idọba-oriọna nke ọla-edo anāgwaghi agwa ka ọ gēdo oriọna nile n'usoro n'iru Jehova mb͕e dum. 5 Ọzọ, i gēwere utu ọka flour, sie ya ka ọ buru ob͕e achicha iri na abua: uzọ abua n'uzọ iri nke ephah gādiri otù ob͕e achicha. 6 I gēdo kwa ha n'usoro abua, isi n'otù usoro, n'elu table nke ọla-edo anāgwaghi agwa n'iru Jehova. 7 I gētiye kwa frankincense anāgwaghi agwa n'elu usoro ọ bula, ka ọ we ghọrọ achicha ahu ihe-ncheta, bú àjà-ọku anāchuru Jehova. 8 Kwa-ubọchi-izu-ike o gēdo ya n'usoro n'iru Jehova mb͕e dum; o sitere n'umu Israel, ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ka ọ bu. 9 Ọ gādiri Eron na umu-ya ndikom; ha gēri ya n'ebe di nsọ n'ihi na ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ buru ya sitere n'àjà-ọku nile nke Jehova, ọ bu ukpuru ebighi-ebi. 10 Nwa-nwoke nke nwayi Israel, nwoke ahu bu kwa nwa nke nwoke Ijipt, we pua je n'etiti umu Israel: nwa-nwoke nke nwayi Israel ahu na otù onye Israel we lua ọ̀gù n'ọmuma-ulo-ikwū; 11 nwa-nwoke nke nwayi Israel ahu we kpọlu Aha ahu, kọcha kwa: ha we me ka ọ biakute Moses. Aha nne-ya bu Shelomit, nwa-nwayi Dibri, nke ebo Dan. 12 Ha we me ka ọ nọdu n'ebe anēdebe ndi-nkpọrọ, ka ewe kọrọ ha ala okwu ahu n'ọnu Jehova. 13 Jehova we gwa Moses, okwu, si, 14 Me onye ahu nākọcha akọcha ka ọ pua je n'azu ọmuma-ulo-ikwū; ndi nile nke nuru olu-ya gēbikwasi aka-ha n'isi-ya, nzukọ nile gātub͕u ya na nkume. 15 I gāgwa kwa umu Israel okwu, si, Onye ọ bula, mb͕e ọ nākọcha Chineke-ya, o gēbu nmehie-ya. 16 Onye nākpọlu kwa aha Jehova, aghaghi ime ka ọ nwua; nzukọ Israel nile aghaghi itub͕u ya na nkume: dika anēme ọbìa, otú a ka agēme onye amuru n'ala, mb͕e ọ nākpọlu aha Jehova agēme ka ọ nwua. 17 Onye ọ bula mb͕e ọ gētipu ndu madu, aghaghi ime ka ọ nwua; 18 Onye nētipu kwa ndu anu-ulo gākwughachi ya: ndu lara ndu. 19 Ọzọ, onye ọ bula, mb͕e ọ gēme ka ọlu di n'aru madu-ibe-ya; dika ọ meworo, otú a ka agēme ya; 20 nkpaji lara nkpaji, anya lara anya, ezé lara ezé: dika o meworo ka ọlu di n'aru madu, otú a ka agēme ka ọlu di n'aru ya. 21 Onye nētib͕u anu-ulo gākwughachi ya: ma onye nētib͕u madu, agēme ka ọ nwua. 22 Otù ikpé diri unu, dika anēkpe ọbìa, otú a ka agēkpe onye amuru n'ala: n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu. 23 Moses we gwa umu Israel okwu, ha we me onye ahu nākocha akọcha ka ọ pua je n'azu ọmuma-ulo-ikwū, ha we tub͕ue ya na nkume. Umu Israel we me dika Jehova nyere Moses iwu.

Levitikọs 25

1 Jehova we gwa Moses okwu n'ugwu Sainai, si, 2 Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e unu gābà n'ala nke Mu onwem nēnye unu, ala ahu gēdebe-kwa-ra Jehova ubọchi-izu-ike. 3 Arọ isi ka i gāgha nkpuru n'ubi-gi, arọ isi ka i gākwacha osisi ubi-vine-gi, chikọta kwa ihe-ọmume-ya; 4 ma n'arọ nke-asa ubọchi-izu-ike nke idebe-ubọchi-izu-ike gādiri ala ahu, bú ubọchi-izu-ike agēdebere Jehova: aghala nkpuru n'ubi-gi, akwacha-kwa-la osisi ubi-vine-gi. 5 Ewela ihe-ubi-gi nke nēpu n'onwe-ya, aghọrọ-kwa-la nkpuru nke osisi vine gi nke anākwachaghi akwacha: arọ nke idebe-ubọchi-izu-ike ka ọ gāburu ala ahu. 6 Ubọchi-izu-ike nke ala ahu gābu-kwa-ra unu ihe-oriri; ọ gāburu gi, buru kwa orù-gi nwoke, buru kwa orù-gi nwayi, buru kwa onye i goro ọlu, buru kwa onye nānọdu n'ulo-gi, bú ndi nọyere gi dika ọbìa; 7 anu-ulo-gi, na anu-ọhia nke di n'ala-gi, gēnwe kwa ihe-ọmume-ya nile n'ihe-oriri. 8 I gāgu-kwa-ra onwe-gi ubọchi-izu-ike asa, bú arọ, arọ asa ub͕ò asa; ubọchi nke ubọchi-izu-ike asa, bú arọ arọ, gābu-kwa-ra gi ọgu arọ abua na iteghete. 9 I gēme kwa ka opì-ike nke nādasi uda ike gābiga rue ebe nile n'ọnwa nke-asa, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu; n'ubọchi nkpuchi-nmehie ka unu gēme ka opì-ike gabiga n'ala-unu nile. 10 Unu gēdo kwa arọ nke-ọgu-abua-na-iri ahu nsọ, kpọsa kwa n'ala ahu nile si na ndi nile bi nime ya nwere onwe-ha: jubile ka arọ ahu gāburu unu; unu gālaghachi kwa, onye ọ bula n'ihe-onwunwe-ya, laghachi kwa, onye ọ bula n'ab͕uru-ya. 11 Jubile ka arọ nke-ọgu-abua-na-iri ahu gāburu unu: unu aghala nkpuru, unu ewe-kwa-la ihe-ubi nēpu n'onwe-ya nime ya, unu aghọrọ-kwa-la nkpuru nke osisi vine nile anākwachaghi akwacha. 12 N'ihi na jubile ka ọ bu; nsọ ka ọ gādiri unu: unu gēsite n'ubi rie ihe-ọmume-ya. 13 N'arọ jubile a ka unu gālaghachi, onye ọ bula n'ihe-onwunwe-ya. 14 Mb͕e i gērenye madu-ibe-gi ihe-orire, ma-ọbu zuru ihe n'aka madu-ibe-gi, unu emeritala onwe-unu ihe-ike: 15 dika ọnu-ọgugu arọ si di site n'arọ jubile, otú a ka i gāzuru ihe n'aka madu-ibe-gi, dika ọnu-ọgugu arọ ihe-ọmume si di, otú a ka ọ gērenye gi. 16 Dika iba-uba nke arọ si di ka i gēme ka ọnu-ahia-ya ba uba, ọ bu kwa dika nbilata arọ si di ka i gēbilata ọnu-ahia-ya; n'ihi na ọnu-ọgugu ihe-ọmume ka ya onwe-ya nērenye gi. 17 Unu emerita-kwa-la onwe-unu ihe-ike; ma i gātu egwu Chineke-gi: n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi. 18 Unu gēme kwa ukpurum nile, ikpém nile ka unu gēdebe kwa, me kwa ha; unu gēbi kwa n'ala ahu na ntukwasi-obi. 19 Ala ahu gāmi nkpuru-ya, unu gēriju afọ, biri nime ya na ntukwasi-obi. 20 Ma mb͕e unu gāsi, Gini ka ayi gēri n'arọ nke-asa? le, ayi agaghāgha nkpuru, ayi agaghi-achikọta kwa ihe-ọmume-ayi: 21 M'gēnye kwa ngọzim iwu idakwasi unu n'arọ nke-isi, ọ gēme-kwa-ra arọ atọ ahu ihe-ọmume. 22 Unu gāgha kwa nkpuru n'arọ nke-asatọ, rie ufọdu nime ihe-ọmume ahu, bú ihe ochie; rue arọ nke-iteghete, rue mb͕e ihe-ọmume-ya gābata, unu gēri ihe ochie. 23 Agaghi-ere ala ahu rue mb͕e ọ gādiru n'ihi na Mu nwe ala ahu: n'ihi na ndi-ọbìa na ndi-nnọdu ka unu bu n'alam. 24 N'ala nile nke ihe-onwunwe-unu unu gēnye kwa ihe-nb͕aputa bayere ala ahu. 25 Mb͕e nwa-nne-gi gāda ob͕eye, we re ufọdu nime ihe-onwunwe-ya, onye-nb͕aputa-ya nke bu onye-aru-ya gābia kwa, b͕aputa ihe nwa-nne-ya reworo. 26 Onye ọ bula, mb͕e ọ nēnweghi onye-nb͕aputa, ma aka-ya eruwo, ọ we huta ihe gēzu nb͕aputa-ya; 27 ya gu kwa arọ nile nke orire-ya, nyeghachi nwoke ọ renyere ya ihe fọduru; ọ gālaghachi kwa n'ihe-onwunwe-ya. 28 Ma mb͕e aka-ya achọtaghi ihe gēzu inweghachi ya n'onwe-ya, ihe ọ reworo gādi kwa n'aka onye zuworo ya rue arọ jubile: ma na jubile ahu ọ gāpu, ọ gālaghachi kwa n'ihe-onwunwe-ya. 29 Ọzọ, onye ọ bula, mb͕e ọ gēre ulo-obibi n'obodo nwere mb͕idi buruburu, nb͕aputa-ya gādi kwa rue mb͕e arọ orire-ya gēruzù; otù nb͕a-arọ ka nb͕aputa-ya gādi. 30 Ma ọ buru na ab͕aputaghi ya rue mb͕e ọ nwezuru arọ zuru okè, ulo ahu nke di nime obodo nwere mb͕idi buruburu gēguzosi-kwa-ra onye nāzú ya ike rue mb͕e ọ gādiru, rue ọb͕ọ-ya nile: ọ gaghi-apu na jubile. 31 Ma ulo nile nke obodo ntà nēnweghi mb͕idi buruburu, tiyere ọhia nke ala ahu ka agāgu ha, nb͕aputa diri ha, na jubile ka ha gāpu kwa. 32 Ma obodo nile nke ndi Livai, ulo nile nke obodo nile nke ihe-onwunwe-ha, ike nb͕aputa ebighi-ebi ka ndi Livai gēnwe. 33 Ma asi na ọnye ọ bula nime ndi Livai ab͕aputa ihe, ulo nke ereworo, na obodo nke ihe-onwunwe-ya, gāpu kwa na jubile: n'ihi na ulo nile nke obodo nile nke ndi Livai bu ihe-onwunwe-ha n'etiti umu Israel. 34 Ma agaghi-ere ọhia nke ebe-ita-nri nke obodo-ha; n'ihi na ihe-onwunwe ebighi-ebi ka ọ buru ha. 35 Ọzọ, mb͕e nwa-nne-gi gāda ob͕eye, aka-ya ewe ghara idi ike n'ebe-obibi-gi; i gēye-kwa-ra ya aka: dika ọbìa na onye-nnọdu ka ọ gābu, o gēbiyere kwa gi. 36 Anarala ya uma ma-ọbu ọmuru-nwa; ma tua egwu Chineke-gi: ka nwa-nne-gi we biyere gi. 37 Enyela ya ego-gi n'uma, enye-kwa-la ya ihe-oriri-gi n'ọmuru-nwa. 38 Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Nke mere ka unu si n'ala Ijipt puta, inye unu ala Kenean, iburu unu Chineke. 39 Ọzọ, mb͕e nwa-nne-gi gāda ob͕eye n'ebe-obibi-gi, we renye gi onwe-ya; emela ka ọ fè òfùfè nke orù: 40 dika onye egoro ọlu, dika onye-nnọdu, ka ọ gānọ n'aka-gi; rue arọ jubile ka ọ gēfè òfùfè n'aka-gi: 41 o gēsi kwa n'aka-gi pua, ya onwe-ya na umu-ya tiyere ya, ọ gālaghachikuru kwa ab͕uru-ya, ihe-onwunwe nke nna-ya-hà ka ọ gālaghachikuru kwa. 42 N'ihi na ndi-orùm ka ha bu, ndi M'mere ka ha si n'ala Ijipt puta: agaghi-ere ha dika anēre orù. 43 Ewela nkpab͕u zọda ya; ma tua egwu Chineke-gi. 44 Ma orù-gi ndikom na orù-gi ndinyom, ndi i gēnwe; site n'aka mba nile nke di unu buruburu, site n'aka-ha ka unu gāb͕ata orù-ndikom na orù-ndinyom. 45 Ọzọ kwa, ufọdu nime umu ndi-nnọdu ndi nọ dika ọbìa n'ala-unu, ufọdu nime ha ka unu gāb͕ata, na ufọdu nime ab͕uru-ha ndi nọ n'ala-unu ndi ha muru n'ala-unu: ha gābu-kwa-ra unu ihe-onwunwe. 46 Unu gēme ha ka ha buru ihe-nketa umu-unu ndi gānochi unu gēnwe, inweta dika-onwunwe; rue mb͕e ebighi-ebi ufọdu nime ndi ahu ka unu gēme ka ha buru orú-unu: ma unu ewela nkpab͕u zọda umu-nne-unu, bú umu Israel, nāzọdarita onwe-unu n'otù n'otù. 47 Ọzọ, mb͕e aka ọbìa ma-ọbu onye-nnọdu n'ala-unu gēru inwe àkù, ma nwa-nne-gi adawo ob͕eye n'akuku-ya, were onwe-ya renye ọbìa ma-ọbu onye-nnọdu n'ala-gi, ma-ọbu were onwe-ya renye onye bayere nkpọrọgwu n'ab͕uru ọbìa: 48 mb͕e eresiri ya, nb͕aputa diri ya; otù onye nke sitere n'umu-nne-ya gāb͕aputa ya: 49 ma-ọbu nwa-nne nna-ya, ma-ọbu nwa nwa-nne nna-ya, gāb͕aputa ya; ma-ọbu onye-aru-ya site n'ab͕uru-ya gab͕aputa ya; ma ọ buru na aka-ya erue inwe àkù, ọ gāb͕aputa onwe-ya. 50 Ya na onye b͕aworo ya gāgu kwa site n'aro ọ were onwe-ya renye ya rue arọ jubile: ego orire-ya gādi kwa ka ọnu-ọgugu arọ; dika ubọchi nile nke onye egoro ọlu ka ọ gānọ n'aka-ya. 51 Ọ buru na ọtutu arọ fọduru, dika ha si di ka ọ gēsite n'ego orire-ya nyeghachi ihe-nb͕aputa-ya. 52 Ma ọ buru na ole-na-ole fọduru n'arọ rue arọ jubile, ọ gāgu-kwa-ra ya; dika arọ-ya nile si di ka ọ gēnyeghachi ihe-nb͕aputa-ya. 53 Dika onye egoro ọlu kwa-arọ ka ọ gānọ n'aka-ya, ọ gaghi-ewere nkpab͕u zọda ya n'anya-gi. 54 Ma ọ buru na ab͕aputaghi ya n'arọ ndia, ọ gābu kwa n'arọ jubile, ya onwe-ya, na umu-ya tiyere ya. 55 N'ihi na Mu ka umu Israel buru ndi-orù; ndi-orùm ka ha bu ndi M'mere ka ha si n'ala Ijipt puta: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

Levitikọs 26

1 Unu emerela onwe-unu ihe-efu ọ bula, unu eguzoro-kwa-la onwe-unu arusi apiri api, ma-ọbu ogidi, unu etiye-kwa-la nkume emere ka o yie ihe n'ala-unu, ikpọ isi ala nye ya: n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu. 2 Unu gēdebe ubọchi-izu-ikem nile, tu kwa egwu ebe nsọm: Mu onwem bu Jehova. 3 Ọ buru na unu ejeghari n'ukpurum nile, ọ buru kwa na unu edebe ihe nile M'nyere n'iwu, we me ha: 4 M'gēnye kwa miri-ozuzo-unu na mb͕e-ha, ala gāmi kwa ihe-ọmume-ya, osisi nke ọhia gāmi kwa nkpuru-ha. 5 Nzọcha-ọka-unu gēru ọghughọ-nkpuru-vine, ọghughọ-nkpuru-vine gēru kwa ọghigha-nkpuru: unu gēriju nri-unu afọ, biri kwa n'ala-unu na ntukwasi-obi. 6 M'gēnye udo n'ala, unu gēdina kwa ala, ọ dighi kwa onye ganēme ka unu ma jijiji: M'gēme kwa ka ajọ anu-ọhia kwusi n'ala, mma-agha agaghi-agabiga kwa n'ala-unu. 7 Unu gāchu ndi-iro-unu, ha gāda kwa n'iru unu site na mma-agha. 8 Madu ise n'etiti unu gāchu ọgu madu ise, ọgu madu ise n'etiti unu gāchu kwa orú nnù madu na nnù madu ise: ndi-iro-unu gāda kwa n'iru unu site na mma-agha. 9 M'gēche unu iru, me kwa ka unu mua ọmùmù, me kwa ka unu ba uba: M'gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum guzosie ike n'ebe unu nọ. 10 Unu gēri ihe ochie nke anēdebe site na mb͕e ochie, unu gēweputa kwa nke-ochie n'iru nke-ọhu. 11 M'gētiye ebe-obibim n'etiti unu: nkpuru-obim agaghi-asọ kwa unu oyi. 12 M'ganējeghari n'etiti unu, M'gābu-kwa-ra unu Chineke, unu onwe-unu gābu-kwa-ram otù ndi. 13 Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Nke mere ka unu si n'ala Ijipt, si kwa n'iburu ha ndi-orù, puta; M'tijiwo kwa nkpọrọ nile nke yoke-unu, me kwa ka unu je ije iguzo-ọtọ. 14 Ma ọ buru na unu egeghm nti, unu ewe ghara ime ihe nile ndia M'nyere n'iwu; 15 ọ buru kwa na unu aju ukpurum nile, ọ buru kwa na nkpuru-obi-unu asọ ikpém nile oyi, unu ewe ghara ime ihe nile M'nyere n'iwu, ka unu we mebie ọb͕ub͕a-ndum; 16 Mu onwem gēme kwa unu nka; M'gēme obi-ọlulọ-miri ka ọ buru onye-nlekọta-unu, bú ọtita-aru na aru-ọku, nēme ka anya-unu hubìe uzọ, nēme kwa ka nkpuru-obi-unu b͕azepu: unu gāgha kwa nkpuru-unu n'efu, ndi-iro-unu gēri kwa ya. 17 M'gēche irum imegide unu, agētib͕u kwa unu n'iru ndi-iro-unu: ndi nākpọ unu asì gāzọda unu; unu gāb͕alaga kwa mb͕e ọ nādighi onye nāchu unu. 18 Ma ọ buru na unu agaghi-egem nti rue ihe ndia, M'gādọ kwa unu aka na nti ub͕ò asa ọzọ n'ihi nmehie nile unu. 19 M'egetiji nweli-elu nke ike-unu; M'gēme kwa elu-igwe-unu ka ọ di ka ígwè, me kwa ala-unu ka ọ di ka ọla: 20 ike-unu gāgwu kwa n'efu: ala-unu agaghi-ami kwa ihe-ọmume-ya, osisi nke ala agaghi-ami kwa nkpuru-ha. 21 Ma ọ buru na unu ejeghari n'imegidem, we ghara ikwe igem nti; M'gātukwasi kwa unu ihe-otiti ub͕ò asa ọzọ dika nmehie-unu nile si di. 22 M'gēzite anu-ohia n'etiti unu, ha gēme kwa ka unu b͕a aka umu, ha gēb͕upu kwa anu-ulo-unu, me kwa ka unu di ole-na-ole, uzọ nile unu gātọb͕ọ kwa n'efu. 23 Ma ọ buru na adọghi unu aka na nti n'ebe M'nọ site n'ihe ndia, ma unu nējeghari n'imegidem; 24 Mu onwem gējeghari kwa n'imegide unu; M'gēti kwa unu ihe ub͕ò asa, ọbuná Mu onwem, n'ihi nmehie nile unu. 25 M'gēme kwa ka mma-agha biakwasi unu, nke nābọ̀ ọ́bọ̀ ọb͕ub͕a-ndum; agāchikọta kwa unu nime obodo nile unu: M'gēzite kwa ajọ ọria nēfe efe n'etiti unu; agēnye kwa unu n'aka ndi-iro. 26 Mb͕e M'gākpajiri unu nkpa-n'aka-unu, bú achicha, ndinyom iri gēsi achicha-unu n'otù ite-ọku, ha gēweghachi kwa achicha-unu n'ọtùtù: unu gēri kwa, ma afọ agaghi-eju unu. 27 Ma ọ buru na unu agaghi-egem nti n'ihe a, ma unu nējeghari n'imegidem; 28 M'gējeghari kwa n'imegide unu n'ọnuma; M'gādọ kwa unu aka na nti ub͕ò asa, ọbuná Mu onwem, n'ihi nmehie nile unu. 29 Unu gēri anu-aru umu-unu ndikom, anu-aru umu-unu ndinyom ka unu gēri kwa. 30 M'gēme ka ebe di elu nke unu tọb͕ọrọ n'efu, M'gēb͕utu kwa arusi-anyanwu nile unu, tukwasi kwa ozu-unu n'ozu nile nke arusi-unu; nkpuru-obim gāsọ kwa unu oyi. 31 M'gēme obodo nile unu nkpọnkpọ ebe, me kwa ebe nsọ unu ka ha tọb͕ọrọ n'efu, M'gaghi-anu kwa ísì utọ unu. 32 Mu onwem gēme kwa ala-unu ka ọ tọb͕ọrọ n'efu: ibobo ya gānwu kwa ndi-iro-unu n'aru, bú ndi di nime ya. 33 Unu ka M'gēfesa kwa n'etiti mba nile, M'gāmipu kwa mma-agha chua unu n'azu: ala-unu gābu kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu, obodo-unu nile gābu kwa nkpọnkpọ ebe. 34 Mb͕e ahu ka ubọchi-izu-ike-ya nile gātọ ala ahu utọ ubọchi nile nke itọb͕ọ-n'efu ahu, mb͕e unu onwe unu nọ kwa n'ala ndi-iro-unu; mb͕e ahu ka ala gākwusi n'ọlu, ubọchi-izu-ike-ya nile gātọ kwa ya utọ. 35 Ubọchi nile nke itọb͕ọ-n'efu ahu ka ọ gākwusi n'ọlu: nke ọ nākwusighi n'ubọchi-izu-ike-unu, mb͕e unu biri n'elu ya. 36 Ma ndi nāfọdu n'etiti unu, M'gēme ka ida-mbà ba n'obi-ha n'ala ndi-iro-ha: olu nke akwukwọ-osisi ifufe nēfepu gāchu kwa ha; ha gāb͕alaga nb͕alaga mma-agha; ha gāda kwa mb͕e ọ dighi onye nāchu ha. 37 Ha gāsurita ngọngọ, otù n'aru ibe-ya, dika n'iru mma-agha, mb͕e onye nāchu ha adigh: ma nguzosi-ike n'iru ndi-iro-unu agaghi-adiri unu. 38 Unu gāla kwa n'iyì n'etiti mba nile ọzọ, ala ndi-iro-unu gēri kwa unu. 39 Ndi nāfọdu n'etiti unu gāta aru n'ajọ omume-ha n'ala nile nke ndi-iro-unu; ọzọ kwa, n'ajọ omume nile nke ndi bu nna-ha, ha gēso kwa ha ta aru. 40 Ha gēkwuputa ajọ omume-ha, na ajọ omume nke ndi bu nna-ha, nime nmekpu-ha nke ha mekpurum, ha gēkwuputa kwa na n'ihi na ha jeghariri n'imegidem, 41 Mu onwem we nējeghari kwa n'imegide ha, me ka ha ba n'ala ndi iro ha: ma ọ buru na obi-ha nke anēbighi úgwù eruru ala mb͕e ahu, ọ buru kwa na ahuhu ajọ omume-ha atọ ha utọ mb͕e ahu; 42 M'gēcheta kwa ọb͕ub͕a-ndu Mu na Jekob b͕ara; ọzọ kwa, ob͕ub͕a-ndu Mu na Aisak b͕ara, ọzọ kwa, ob͕ub͕a-ndu Mu na Abraham b͕ara, ka M'gēcheta; ala ahu ka M'gēcheta kwa. 43 Ha gārapu kwa ala ahu, ubọchi-izu-ike-ya nile gātọ kwa ya utọ, n'itọb͕ọ-n'efu ahu mb͕e ha nānọghi ya; ahuhu ajọ omume-ha gātọ kwa ha onwe-ha utọ: n'ihi na, ọbuná n'ihi na ikpém nile ka ha juru, ọ bu kwa ukpurum nile ka nkpuru-obi-ha sọrọ oyi. 44 Ma ọbuna n'ihe a kwa, mb͕e ha nọ n'ala ndi-iro-ha, M'gaghi-aju ha, M'gaghi-asọ kwa ha oyi, ime ka ha gwusia, na imebi ọb͕ub͕a-ndum nke Mu na ha b͕ara: n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke ha: 45 M'gēcheta kwa n'ihi ha ọb͕ub͕a-ndu nke ndi-mbu-ha, ndi M'mere ka ha si n'ala Ijipt puta n'anya mba nile ọzọ, ka M'we buru ha Chineke: Mu onwem bu Jehova. 46 Ndia bu ukpuru na ikpé na iwu, nke Jehova nyere n'etiti Ya na umu Israel n'ugwu Sainai site n'aka Moses.

Levitikọs 27

1 Jehova we gwa Moses okwu, si, 2 Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e onye ọ bula gēmezu nkwa, dika okwu si di ka madu nile gāburu Jehova. 3 Ọgugu ọnu gi gābu kwa nke nwoke site n'onye b͕ara orú arọ we rue onye b͕ara ọgu aro atọ, ọ̀rùrù-ọnu-gi gābu kwa ọgu shekel ọla ọcha abua na iri, dika shekel nke ebe nsọm si di. 4 Ma ọ buru na nwayi ka ọ bu, ọ̀rùrù-ọnu-gi gābu kwa orú shekel na iri. 5 Ma ọ buru na ọ bu site n'onye b͕ara arọ ise we rue onye b͕ara orú arọ, ọ̀rùrù-ọnu-gi nke nwoke gābu kwa orú shekel, ma ọ gāburu nwayi shekel iri. 6 Ma ọ buru na ọ bu site n'onye ruru otù ọnwa we rue onye b͕ara arọ ise, ọ̀rùrù-ọnu-gi nke nwoke gābu kwa shekel ọla-ọcha ise, ma shekel ọla-ọcha atọ ka ọ̀rùrù-ọnu-gi gāburu nwayi. 7 Ma ọ buru na ọ bu site n'onye b͕ara ọgu arọ atọ we gaba n'iru; ọ buru na ọ bu nwoke, ọ̀rùrù-ọnu-gi gābu kwa shekel iri na ise, ma ọ gāburu nwayi shekel iri. 8 Ma ọ buru na onye dara ob͕eye ka ọ bu kari ọ̀rùrù-ọnu-gi, agēguzo kwa ya n'iru onye-nchu-àjà, onye-nchu-àjà gārù kwa ya ọnu; dika aka onye ahu nke nēkwe nkwa ruru ka onye-nchu-àjà gārù ya ọnu. 9 Ma ọ buru na ọ bu anu-ulo, nke madu nēsite na ya weta nso Jehova onyinye iji biaru nso, ihe ọ bula madu gēsite na ya nye Jehova gādi nsọ. 10 Ọ gaghāb͕anwe ya, ọ gaghi-enwo kwa ya, ezi ihe n'ọnọdu ihe ọjọ, ma-ọbu ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe: ma ọ buru na o were anu-ulo nwo anu-ulo ma-ọli nke ahu di kwa nsọ, ihe eji nwo ya gādi kwa nsọ. 11 Ma ọ buru na ọ bu anu-ulo ọ bula ruru árú, nke ha nēsiteghi na ya weta nso Jehova onyinye iji biaru nso, ọ gēme kwa ka anu-ulo ahu guzo n'iru onye-nchu-àjà: 12 onye-nchu-àjà gārù kwa ya ọnu, ma ọ bu ezi ihe ma-ọbu ihe ọjọ: dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di, gi onye-nchu-àjà, otú a ka ọ gādi. 13 Ma ọ buru na ọ gāb͕aputa ya n'ezie, ọ gātukwasi kwa otù uzọ n'uzọ ise ya n'ọ̀rùrù-ọnu-gi. 14 Ọzọ, mb͕e onye ọ bula gēdo ulo-ya nsọ idiri Jehova nsọ, onye-nchu-àjà gārù kwa ya ọnu, ma ọ bu ezi ulo ma-ọbu ulo ọjọ: dika onye-nchu-àjà gārù ya ọnu, otú a ka o gēguzo. 15 Ọ buru kwa na onye ahu nke nēdo ya nsọ ab͕aputa ulo-ya, ọ gātukwasi kwa otù uzọ n'uzọ ise nke ego ọ̀rùrù-ọnu-gi, ọ gābu kwa nke ya. 16 Ma ọ buru na onye ọ bula ewere ufọdu nime ala-ubi nke ihe-onwunwe-ya doro Jehova nsọ, ọ̀rùrù-ọnu-gi gādi kwa ka nkpuru-ọghigha-ya si di; otù homer nke nkpuru-ọghigha ọka barley, agārù ọnu-ya n'ọgu shekel ọla-ọcha abua na iri. 17 Ọ buru na o sitere n'arọ jubile do ala-ubi-ya nsọ, dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di ka o gēguzo. 18 Ma ọ buru na o do ala-ubi-ya nsọ mb͕e jubile gasiri, onye-nchu-àjà gāgu-kwa-ra ya ego-ya dika arọ fọduru iru arọ jubile si di, agāgubì kwa ihe n'ọ̀rùrù-ọnu-gi. 19 Ma ọ buru na onye ahu nke nēdo ala-ubi nsọ ab͕aputa ya n'ezie, ọ gātukwasi kwa ya otù uzọ n'uzọ ise nke ego ọ̀rùrù-ọnu-gi, agēme kwa ka o guzosiere ya ike. 20 Ma ọ buru na ọ b͕aputaghi ala-ubi ahu, ma-ọbu na ọ renyewo onye ọzọ ala-ubi ahu, agaghi-ab͕aputa ya ọzọ: 21 ma ala-ubi ahu, n'òpùpù-ya nime jubile, gādiri Jehova nsọ, dika ala-ubi nke ewezugara ka ebibie ya; onye-nchu-àjà gēnwe ihe-onwunwe ala-ubi ahu. 22 Ma ọ buru na o doro Jehova ala-ubi ọ zuworo nsọ, bú nke nēsiteghi n'ala-ubi nke ihe-onwunwe-ya; 23 onye-nchu-àjà gāgu-kwa-ra ya ọgugu nke ọ̀rùrù-ọnu-gi rue arọ jubile: ọ gēnye kwa ọ̀rùrù-ọnu-gi n'ubọchi ahu, dika ihe nsọ diri Jehova. 24 N'arọ jubile ala-ubi ahu gālaghachiri onye azutara ya n'aka-ya, bú onye nwe ihe-onwunwe nke ala ahu. 25 Ọ̀rùrù-ọnu-gi nile gādi kwa ka shekel nke ebe nsọ si di: orú gerah gābu shekel ahu. 26 Nání nwa eburu uzọ mu n'etiti anu-ulo, nke anēme ka ọ buru nwa eburu uzọ muru Jehova, ọ dighi onye ọ bula gēdo ya nsọ: ma ọ bu ehi ma-ọbu aturu, ihe Jehova nwere ka ọ bu. 27 Ma ọ buru na ọ di n'etiti anu-ulo ruru árú, ọ gāb͕aputa kwa ya dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di, ọ gātukwasi kwa ya otù uzọ n'uzo ise ya: ma ọ buru na ab͕aputaghi ya, agēre kwa ya dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di. 28 Nání, ọ dighi ihe ọ bula agēre ma-ọbu b͕aputa, nke ewezugara ka ebibie ya, nke onye ọ bula gēwezugara Jehova ka ebibie ya, site n'ihe nile o nwere, site na madu na anu-ulo, ma-ọbu site n'ala-ubi nke ihe-onwunwe-ya: ihe ọ bula ewezugara ka ebibie ya, ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ buru Jehova. 29 Ọ dighi onye ọ bula agāb͕aputa, nke ewezugara ka ebibie ya, nke agēwezuga ka ebibie ya site n'etiti madu: aghaghi ime ka ọ nwua. 30 Otù uzọ n'uzọ iri ihe nile nke ala, site na nkpuru-ọghigha nke ala, ma ọbu site na nkpuru osisi, ihe Jehova nwere ka ọ bu: ọ bu ihe nsọ diri Jehova. 31 Ma ọ buru na onye ọ bula ab͕aputa ihe nime otù uzọ n'uzọ iri ihe-ya ma-ọli, otù uzọ n'uzọ ise ka ọ gātukwasi ya. 32 Otù uzọ kwa n'uzọ iri nke ìgwè ehi na ìgwè ewu na aturu nile, ihe ọ bula nke nāgabiga n'okpuru nkpa-n'aka, otù uzọ n'uzọ iri gābu ihe nsọ diri Jehova. 33 Ọ gaghi-etucha n'etiti ezi anumanu na anumanu ọjọ ọ gaghi-enwo kwa ya: ma ọ buru na o nwo ya ma-ọli, nke ahu di kwa nsọ ihe eji nwo ya gādi kwa nsọ; agaghi-agbnwe ya. 34 Ndia bu ihe enyere n'iwu, nke Jehova nyere Moses n'iwu bayere umu Israel n'ugwu Sainai.

Ọnu-Ọgugu 1

1 Jehova we gwa Moses okwu n'ọzara Sainai, n'ulo-ikwū nzute, n'ubọchi mbu nke ọnwa nke-abua, n'arọ nke-abua nke ọpupu ha puru n'Ijipt, si, 2 Gutanu ọnu-ọgugu nzukọ nile nke umu Israel, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha nile, nwoke ọ bula, onye na isi-ya onye na isi-ya; 3 site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha n'Israel, unu gāgukọta ha, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di, gi onwe-gi na Eron. 4 Madu ganọye-kwa-ra unu, otù nwoke gādiri otù ebo; nwoke ọ bula, onye-isi ulo nna-ya-hà ka ọ bu. 5 Ndia bu kwa aha ndikom unu na ha gēguzo: nke Reuben; Elizua nwa Shedeua. 6 Nke Simeon; Shelumiel nwa Zurishadai. 7 Nke Juda, Nahshon nwa Aminadab. 8 Nke Isaka; Netanel nwa Zua. 9 Nke Zebulun; Eliab nwa Hilon. 10 Nke umu Josef: nke Efraim; Elishama nwa Amihud: nke Manase; Gameliel nwa Pedahzua. 11 Nke Benjamin; Abidan nwa Gideoni. 12 Nke Dan; Ahieza nwa Amishadai. 13 Nke Asha; Pagiel nwa Ọkran. 14 Nke Gad; Eliasaf nwa Deuel. 15 Nke Naftali; Ahira nwa Inan. 16 Ndia bu ndi akpọrọ nke nzukọ Israel, ndi-isi ebo nile nke ndi bu nna-ha; ndi-isi nke usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Israel ka ha bu. 17 Moses na Eron we chiri ndikom ndia nke akpọrọ n'aha n'aha: 18 ọ bu kwa nzukọ Israel nile ka ha kpọkọtara n'ubọchi mbu nke ọnwa nke-abua, ha we kọ akukọ osuso-ọmumu-ha dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye na isi-ya onye na isi-ya. 19 Dika Jehova nyere Moses iwu, otú a ka ọ gukọtara ha n'ọzara Sainai. 20 Ma umu Reuben, bú ọkpara Israel, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha, onye na isi-ya onye na isi-ya, nwoke ọ bula site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha; 21 ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Reuben, ha di orú nnù uzọ ise na nnù iri-na-isi na ọgu ise. 22 Nke umu Simeon, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, ndi-ha agukọtara agukọta, n'ọnu-ọgugu aha, onye na isi-ya onye na isi-ya, nwoke ọ bula site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha; 23 ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Simeon, ha di orú nnù uzọ asa na nnù asatọ na ọgu ise. 24 Nke umu Gad, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha; 25 ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Gad, ha di orú nnù uzọ ise na nnù iri-na-anọ na ọgu abua na iri. 26 Nke umu Juda, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'onu-ọgugu aha, site n'onye b͕ara oru arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha; 27 ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Juda, ha di orú nnù uzọ iteghete na nnù isi na ọgu iri. 28 Nke umu Isaka, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha; 29 ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Isaka, ha di orú nnù uzọ isi na nnù iri-na-isi. 30 Nke umu Zebulun, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha; 31 ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Zebulun, ha di orú nnù uzọ asa na nnù atọ na ọgu iri. 32 Nke umu Josef, bú nke umu Efraim, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha; 33 ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Efraim, ha di orú nnù uzọ ise na nnu na ọgu ise. 34 Nke umu Manase, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha; 35 ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Manase, ha di orú nnù uzọ anọ na ọgu iri. 36 Nke umu Benjamin, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha; 37 ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Benjamin, ha di orú nnù uzọ anọ na nnù asatọ na ọgu iri. 38 Nke umu Dan, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ogugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha; 39 ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Dan, ha di orú nnù uzọ asa na nnù iri-na-isi na ọgu iri-na-ise. 40 Nke umu Asha, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha; 41 ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Asha, ha di orú nnù uzọ ise na nnù atọ na ọgu iri-na-ise. 42 Nke umu Naftali, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnuọgugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha; 43 ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Naftali, ha di orú nnù uzọ isi na nnù iri-na-atọ na ọgu iri. 44 Ndia bu ndi agukọtara agukọta, ndi Moses na Eron gukọtara, ha na ndi-isi Israel, bú ndikom iri na abua: otù nwoke otù nwoke diri ulo nna-ya-hà ka ha bu. 45 Ndi nile nke umu Israel agukọtara agukọta we di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha n'Israel; 46 ọbuná ndi nile agukọtara agukọta we di orú nnù ọgu uzọ atọ na uzọ iri-na-ise, na nnù asatọ, na ọgu iri-na-asa, na iri. 47 Ma ndi Livai, dika ebo nke ndi bu nna-ha si di, agukọtaghi ha n'etiti ha. 48 N'ihi na Jehova gwara Moses okwu, si, 49 Nání, agukọtala ebo Livai, aguta-kwa-la ọnu-ọgugu-ha n'etiti umu Israel: 50 ma gi onwe-gi me ndi Livai ka ha buru ndi nēlekọta ebe-obibi ihe-àmà, ndi nēlekọta kwa lhe-ya nile, ndi nēlekọta kwa ihe nile diri ya: ha onwe-ha ganēbu ebe-obibi ahu, na ihe-ya nile: ha onwe-ha gēje-kwa-ra ya ozi, ọ bu kwa buruburu ebe-obibi ahu ka ha gāma ulo-ikwū-ha. 51 Ma na nbuli-ije nke ebe-obibi ahu, ndi Livai gēweda ya: ọzọ, n'ọmuma nke ebe-obibi ahu, ndi Livai gēguzo ya ọtọ: ma onye ala ọzọ nke nābiaru nso, agēme ka ọ nwua. 52 Umu Israel gāma kwa ulo-ikwū-ha, nwoke ọ bula n'akuku ọmuma-ulo-ikwū-ya, na nwoke ọ bula n'akuku ọkọlọtọ-ya, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di. 53 Ma ndi Livai gāma ulo-ikwū-ha buruburu ebe-obibi ihe-àmà ahu, ka iwe we ghara idi n'aru nzukọ umu Israel: ndi Livai gēdebe kwa ihe-ndebe nke ebe-obibi ihe-àmà ahu. 54 Umu Israel we me otú a; dika ihe nile nke Jehova nyere Moses n'iwu si di, otú a ka ha mere.

Ọnu-Ọgugu 2

1 Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si, 2 Umu Israel gāma ulo-ikwū-ha, nwoke ọ bula n'akuku ọkọlọtọ-ya, ha na ihe-iriba-ama nile nke diri ulo nke ndi bu nna-ha: na ncherita-iru ulo-ikwū nzute ka ha gāma ulo-ikwū-ha buruburu. 3 Ndi nāma ulo-ikwū-ha n'akuku. Iru-anyanwu chere iru n'ọwuwa-anyanwu bu ndi nke ọkọlọtọ ọmuma-ulo-i kwū Juda, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: onye-isi umu Juda nwere bu Nahshon nwa Aminadab. 4 Usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ iteghete na nnù isi na ọgu iri. 5 Ndi nāma ulo-ikwū-ha n'akuku-ya bu ebo Isaka: onye-isi umu Isaka nwere bu Netanel nwa Zua: 6 usu-ndi-agha-ya, na ndi-ya agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ isi na nnù iri-na-isi: 7 ebo Zebulun kwa: onye-isi umu Zebulun nwere bu Eliab nwa Hilon: 8 usu-ndi-agha-ya, na ndi-ya agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ asa na nnù atọ na ọgu iri. 9 Ndi nile agukọtara agukọta nke ọmuma-ulo-ikwū Juda di orú nnù orú uzọ na uzọ atọ, na nnù isi, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di. Ha gēbu uzọ buli ije. 10 Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū Reuben di n'akuku Ndida, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di; onye-isi umu Reuben nwere bu Elizua nwa Shedeua. 11 Usu-ndi-agha-ya, na ndi-ya agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ ise na nnù iri-na-isi na ọgu ise. 12 Ndi nāma ulo-ikwū-ha n'akuku-ya bu ebo Simeon: onye-isi umu Simeon nwere bu Shelumiel nwa Zurishadai: 13 usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ asa na nnù asatọ na ọgu ise: 14 ebo Gad kwa: onye-isi umu Gad nwere bu Eliasaf nwa Reuel: 15 usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ ise na nnù iri-na-anọ na ọgu abua na iri. 16 Ndi nile agukọtara agukọta nke ọmuma-ulo-ikwū Reuben di orú nnù uzọ iri na asatọ, na nnù iri-na-asatọ, na ọgu iri-na-abua, na iri, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di. Ha gābu nke-abua n'ibuli ije. 17 Ulo-ikwū nzute gēbuli kwa ije, ya na ọmuma-ulo-ikwū ndi Livai, n'etiti ọmuma-ulo-ikwū nile: dika ha si ama ulo-ikwū-ha, otú a ka ha gēbuli ije, nwoke ọ bula n'akuku-ya, dika ọkọlọtọ nile ha si di. 18 Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū Efraim, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di, di n'akuku Ọdida-anyanwu: onye-isi umu Efraim nwere bu Elishama nwa Amihud. 19 Usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ ise na nnù na ọgu ise. 20 N'akuku-ya ka ebo Manase di: onye-isi umu Manase nwere bu Gameliel nwa Pedahzua: 21 Usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ anọ, na ọgu iri: 22 ebo Benjamin kwa: onye-isi umu Benjamin nwere bu Abidan nwa Gideoni: 23 Usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ anọ na nnù asatọ na ọgu iri. 24 Ndi nile agukọtara agukọta nke ọmuma-ulo-ikwū Efraim di orú nnù uzọ iri-na-atọ, na nnù iri, na ọgu ise, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di. Ha gābu nke-atọ n'ibuli ije. 25 Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū Dan di n'akuku Ugwu, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di; onye-isi umu Dan nwere bu Ahieza nwa Amishadai. 26 Usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ asa na nnù iri-na-isi na ọgu iri-na ise. 27 Ndi nāma ulo-ikwū-ha n'akuku-ya bu ebo Asha: onye-isi umu Asha nwere bu Pagiel nwa Ọkran: 28 usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ ise na nnù atọ na ọgu iri-na-ise: 29 ebo Naftali kwa: onye-isi umu Naftali nwere bu Ahira nwa Inan: 30 usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ isi na nnù iri-na-atọ na ọgu iri. 31 Ndi nile agukọtara agukọta nke ọmuma-ulo-ikwū Dan di orú nnù uzọ iri-na-iteghete, na nnù iri-na-anọ. Ha gābu ndi ikpe azu n'ibuli ije, dika ọkọlọtọ nile ha si di. 32 Ndia bu ndi agukọtara agukọta nke umu Israel, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di: ndi nile agukọtara agukọta nke ọmuma-ulo-ikwū nile, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di, di orú nnù ọgu uzọ atọ na uzọ iri-na-ise, na nnù asatọ, na ọgu iri-na-asa, na iri. 33 Ma agukọtaghi ndi Livai n'etiti umu Israel; dika Jehova nyere Moses iwu 34 Umu Israel we me otú a; dika ihe nile Jehova nyere Moses n'iwu si di, otú a ka ha mara ulo-ikwū-ha dika ọkọlọtọ nile ha si di, ọ bu kwa otú a ka ha buliri ije, nwoke ọ bula dika ab͕uru nile ya si di, n'ulo nna-ya-hà

Ọnu-Ọgugu 3

1 Ma ndia bu osuso-ọmumu nile nke Eron na Moses n'ubọchi Jehova gwara Moses okwu n'ugwu Sainai. 2 Ndia bu kwa aha umu-ndikom Eron; ọkpara-ya, bú Nedab, na Abaihu, na Eleeza, na Itama. 3 Ndia bu aha nke umu-ndikom Eron, bú ndi-nchu-àjà ndi etere manu, ndi ọ mejuru aka ibu ndi-nchu-àjà. 4 Nedab na Abaihu we nwua n'iru Jehova, mb͕e ha wetara nso ọku ala ọzọ n'iru Jehova n'ọzara Sainai, ha enweghi kwa nwa; Eleeza na Itama we buru ndi-nchu-àjà n'iru Eron, bú nna-ha. 5 Jehova we gwa Moses okwu, si, 6 Me ka ebo Livai biaru nso, guzo kwa ha n'iru Eron, bú onye-nchu-àjà, ka ha we jere ya ozi. 7 Ha gēdebe kwa ihe-ndebe-ya na ihe-ndebe nke nzukọ Israel nile n'iru ulo-ikwū nzute, ifè òfùfè nke ebe-obibim. 8 Ha gēdebe kwa ihe nile nke ulo-ikwū nzute, na ihe-ndebe nke umu Israel, ifè òfùfè nke ebe-obibim. 9 I gēwere kwa ndi Livai nye Eron, nye kwa umu-ya ndikom: ndi enyesiworo aha ha nile site n'etiti umu Israel ka ha bu. 10 I gēwere kwa Eron na umu-ya ndikom ka ha buru ndi-nlekọta, ha gēdebe kwa ọlu-nchu-àjà-ha: ma onye ala ọzọ nke nābiaru nso, agēme ka ọ nwua. 11 Jehova we gwa Moses okwu, si, 12 Ma Mu onwem, le, esiwom n'etiti umu Israel were ndi Livai n'ọnọdu nwa ọ bula eburu uzọ mu nke nēmeghe àkpà nwa n'etiti umu Israel; ndi Livai gābu kwa ihe M'nwere: 13 n'ihi na Mu nwe nwa ọ bula eburu uzọ mu; n'ubọchi M'tib͕uru umu nile eburu uzọ mu n'ala Ijipt ka M'doro umu nile eburu uzọ mu n'Israel nsọ nye onwem, ma madu ma anumanu: nkem ka ha bu; Mu onwem bu Jehova. 14 Jehova we gwa Moses okwu n'ọzara Sainai, si, 15 Gukọta umu Livai, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, dika ab͕uru nile ha si di; nwoke ọ bula site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru ka i gāgukọta ha. 16 Moses we gukọta ha n'okwu-ọnu Jehova, dika enyere ya iwu. 17 Ndia bu kwa umu-ndikom Livai n'aha-ha; Giashon, na Kohat, na Merari. 18 Ndia bu kwa aha umu-ndikom Giashon dika ab͕uru nile ha si di; Libni na Shimai. 19 Umu-ndikom Kohat kwa dika ab͕uru nile ha si di; Amram, na Izha, na Hebron, na Uziel. 20 Umu-ndikom Merari kwa dika ab͕uru nile ha si di; Mahli na Mushi. Ndia bu ab͕uru ndi Livai, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di. 21 Nke Giashon bu ab͕uru ndi Libni, na ab͕uru ndi Shimai: ndia bu ab͕uru ndi Giashon. 22 Ndi-ha agukọtara agukọta, n'ọnu-ọgugu ndikom nile, site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru, ndi-ha águkotara agukọta di nnù iri-na-asatọ na ọgu iri-na-ise. 23 Ab͕uru abua nke ndi Giashon nāma ulo-ikwū-ha n'azu ebe-obibi ahu chere iru n'Ọdida-anyanwu. 24 Onye-isi ulo nna ndi Giashon nwere bu Eliasaf nwa Lael. 25 Ihe-ndebe nke umu-ndikom Giashon n'ulo-ikwū nzute bu ebe-obibi na Ulo-ikwū, na ihe-nkpuchi-ya, na ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, 26 na ákwà-ngechi nile nke ogige ahu, na ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ ogige, nke di n'akuku ebe-obibi, na n'akuku ebe-ichu-àjà buruburu, na udọ̀-ya nile bayere òfùfè-ya nile. 27 Nke Kohat bu ab͕uru ndi Amram, na ab͕uru ndi Izha, na Ab͕uru ndi Hebron, na aburu ndi Uziel: ndia bu ab͕uru ndi Kohat. 28 N'ọnu-ọgugu ndikom nile, site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru, ha di orú nnù na otù nnù ọgu iri, nēdebe ihe-ndebe nke ebe nsọ ahu. 29 Ab͕uru nile nke umu Kohat nāma ulo-ikwū-ha n'isi ebe-obibi ahu chere iru na Ndida. 30 Onye-isi ulo nna ab͕uru ndi Kohat nwere bu Elizafan nwa Uziel. 31 Ihe-ndebe-ha bu ib͕e ahu, na table ahu, na ihe-idọba-oriọna, na ebe-ichu-àjà abua, na ihe nile nke ebe nsọ ahu nke ha ji je ozi na ákwà-nkwuchi ahu, na òfùfè-ya nile. 32 Onye-isi nke ndi-isi nke ndi Livai bu Eleeza nwa Eron onye-nchu-àjà, ọ nwere nlekọta ndi nēdebe ihe-ndebe nke ebe nsọ ahu. 33 Nke Merari bu ab͕uru ndi Mahli, na ab͕uru ndi Mushi: ndia bu ab͕uru Merari. 34 Ndi-ha agukọtara agukọta, n'ọnu-ọgugu ndikom nile, site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru, di nnù iri-na-ise na ọgu iri. 35 Onye-isi ulo nna nke ab͕uru abua Merari nwere bu Zuriel nwa Abihail: ha nāma ulo-ikwū-ha n'isi ebe-obibi ahu chere iru n'Ugwu. 36 Nlekọta nke ihe-ndebe nke umu Merari bu ibo nile nke ebe-obibi ahu, na nkpọrọ-ya nile, na ide-ya nile, na akwa ya nile, na ihe-ya nile, na òfùfè-ya nile: 37 na ide nile nke ogige ahu buruburu, na ukwu nile ha, na ǹtú nile ha, na udọ̀ nile ha. 38 Ndi nāma ulo-ikwū-ha n'iru ebe obibi ahu chere iru n'Iru-anyanwu, n'iru ulo-ikwū nzute chere iru n'ọwuwa-anyanwu, bu Moses, na Eron na umu-ya ndikom, nēdebe ihe-ndebe nke ebe nsọ ahu, bú ihe-ndebe nke umu Israel; onye ala ọzọ nke nābiaru nso, agēme ka ọ nwua. 39 Ndi nile agukọtara agukọta nke ndi Livai, ndi Moses na Eron gukọtara n'okwu-ọnu Jehova, dika ab͕uru nile ha si di, ndikom nile, site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru, di orú nnù uzọ abua na nnù iri-na ise. 40 Jehova we si Moses, Gukọta umu-ndikom nile eburu uzọ muru umu Israel, site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru, guta kwa ọnu-ọgugu aha-ha. 41 I gēwe-kwa-ram ndi Livai (Mu onwem bu Jehova) n'ọnọdu umu nile eburu uzọ mu n'etiti umu Israel; na anu-ulo ndi Livai n'ọnọdu umu nile eburu uzọ mu n'etiti anu-ulo umu Israel. 42 Moses we gukọta umu nile eburu uzọ mu n'etiti umu Israel, dika Jehova nyere ya iwu. 43 Ndikom nile eburu uzọ mu, n'onu-ọgugu aha, site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, di orú nnù uzọ abua na nnù iri-na-ise na ọgu iri-na-atọ na iri na atọ. 44 Jehova we gwa Moses okwu, si, 45 Were ndi Livai n'ọnọdu umu nile eburu uzọ mu n'etiti umu Israel, were kwa anu-ulo ndi Livai n'ọnọdu anu-ulo-ha: ndi Livai gābu kwa ihe M'nwere; Mu onwem bu Jehova 46 Ma ndi anāb͕aputa, bú ọgu madu iri-na-atọ na madu iri na atọ ahu sitere na ndi eburu uzọ mu nke umu Israel, ndi eji ka ndi Livai n'ọnu-ọgugu, 47 n'aka-ha ka i gānara shekel ise shekel ise n'isi n'isi; dika shekel nke ebe nsọ ahu si di ka i gēwere ha (shekel bu orú gerah): 48 i gēnye kwa Eron, nye kwa umu-ya ndikom, ego ahu ewere b͕aputa ndi ahu eji ka ndi Livai n'ọnu-ọgugu 49 Moses we nara ego nb͕aputa ahu n'aka ndi fọduru n'ọnu-ọgugu ndi ahu ndi Livai b͕aputara: 50 n'aka umu eburu uzọ mu nke umu Israel ka ọ nara ego ahu; nnù shekel atọ na ọgu asatọ na ise, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; 51 Moses we nye Eron, nye kwa umu-ya ndikom, ego ndi ab͕aputara, n'okwu-ọnu Jehova, dika Jehova nyere Moses iwu.

Ọnu-Ọgugu 4

1 Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si, 2 Guta ọnu-ọgugu umu Kohat site n'etiti umu Livai, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, 3 site n'onye b͕ara orú arọ na iri we gaba n'iru we rue onye b͕ara ọgu arọ abua na iri, onye ọ bula nke nābakuru usu-ndi-agha, ije ozi n'ulo-ikwū nzute. 4 Nka bu òfùfè umu Kohat n'ulo-ikwū nzute, bú ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile: 5 na nbuli-ije nke ọmuma-ulo-ikwū Eron gābà kwa nime, ya na umu-ya ndikom, ha gākwuda ákwà-nb͕ochi nke ákwà-nkwuchi ahu, were ya kpuchie ib͕e ihe-àmà ahu, 6 tiye kwa ihe-nkpuchi akpukpọ seal n'elu ya, b͕akwasi kwa ákwà anunu anunu n'elu, tiye kwa nkpa-n'aka-ya abua nime 7 N'elu table nke irum ka ha gāb͕akwasi ákwà anunu, tiye kwa n'elu ya afere-ya nile, na ngaji-ya nile, na ọkwa-ya nile, na iko nile nke nwusi àjà-ihe-ọṅuṅu: achicha anētiye mb͕e dum gādi kwa n'elu ya: 8 ha gāb͕akwasi kwa n'elu ha ákwà uhie, were kwa ihe-nkpuchi akpukpọ seal kpuchie ya, ha gētiye kwa nkpa-n'aka-ya abua nime. 9 Ha gēwere kwa ákwà anunu, kpuchie ihe-idọba-oriọna nke ihe ahu nēnye ìhè, na oriọna-ya nile, na nkpa-ya nile, na ihe-ikpakepu-ọku-ya nile, na ihe-manu-ya nile, nke ha were jere ya ozi: 10 ha gētiye kwa ya na ihe-ya nile nime ihe-nkpuchi akpukpọ seal, tukwasi ya n'ihe eji bū ya 11 Ọ bu kwa n'elu ebe-ichu-àjà ọla-edo ahu ka ha gāb͕akwasi ákwà anunu, were kwa ihe-nkpuchi akpukpọ seal kpuchie ya, tiye kwa nkpa-n'aka-ya abua nime: 12 ha gēwere kwa ihe nile nke ije-ozi ahu, nke ha ji je ozi n'ebe nsọ ahu, tiye ha nime ákwà anunu, were kwa ihe-nkpuchi akpukpọ seal kpuchie ha, tukwasi ha n'ihe eji bū ha. 13 Ha gēkpopu kwa ntu n'ebe-ichu-àjà, b͕akwasi n'elu ya ákwa ododo: 14 ha gētiye kwa n'elu ya ihe nile ya, nke ha ji je ozi n'akuku ya, bú ihe-igu-ọku-ya nile, na ndudu-ya nile, na osekè-ya nile, na ọkwa-nwusa-ya, ihe nile nke ebe-ichu-àjà ahu; ha gāb͕akwasi kwa n'elu ya ihe-nkpuchi akpukpọ seal, tinye kwa nkpa-n'aka-ya abua nime. 15 Ma mb͕e Eron na umu-ya ndikom kpuchisiri ebe nsọ ahu, na ihe nile nke ebe nsọ ahu, nime nbuli-ije nke ọmuma-ulo-ikwū; emesia, umu Kohat gābia ibū ya: ma ha agaghi-emetu ebe nsọ ahu aka, ha we ghara inwu. Ihe ndia bu ibu umu Kohat n'ulo-ikwū nzute. 16 Ihe-nlekọta Eleeza nwa Eron onye-nchu-àjà bu manu nke ihe nēnye ìhè, na ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ eji uda utọ di iche iche me, na onyinye-inata-iru-ọma anēnye mb͕e dum, na manu nke otite-manu ahu, ihe-nlekọta nke ebe-obibi ahu nile, na nke ihe nile di nime ya, bú nime ebe nsọ ahu na nime ihe-ya nile. 17 Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si, 18 Unu ebipula ebo nke ab͕uru nile nke ndi Kohat n'etiti ndi Livai: 19 ma menu ha nka, ka ha we di ndu, ghara inwu, mb͕e ha nābiaru ebe nsọ ahu kachasi ebe nsọ nile nso: Eron na umu-ya ndikom gābata, do ha, nwoke ọ bula n'òfùfè-ya na n'ibu- ya: 20 ma ha agaghi-abata ihu ebe nsọ ahu ọbuná na obere oge, ka ha ghara inwu. 21 Jehova we gwa Moses okwu, si, 22 Guta kwa ọnu-ọgugu umu Giashon. ha onwe-ha, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, dika ab͕uru nile ha si di; 23 site n'onye b͕ara orú arọ na iri we gaba n'iru rue onye b͕ara ọgu arọ abua na iri ka i gāgukọta ha; onye ọ bula nke nābà ibu agha, ifè òfùfè n'ulo-ikwū nzute. 24 Nka bu òfùfè nke ab͕uru nile nke ndi Giashon, ifè òfùfè na ibū ibu: 25 ha gēbu kwa ákwà-nkwuba nile nke ebe-obibim, na ulo-ikwū nzute, ihe-nkpuchi-ya, na ihe-nkpuchi akpukpọ seal nke dikwasiri ya n'elu, na ákwà-nkwuchi di n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute; 26 na ákwà-ngechi nile nke ogige ahu, na ákwà-nkwuchi di n'onu-uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke ogige ahu, nke di n'akuku ebe-obibi ahu na n'akuku ebe-ichu-àjà buruburu, na udọ̀ nile ha, na ihe nile nke òfùfè-ha, na ihe ọ bula agēmere ha, ha gēfè kwa òfùfè nime ya. 27 N'okwu-ọnu Eron na umu-ya ndikom ka òfùfè nile nke umu ndi Giashon gādi, n'ibu-ha nile, na n'òfùfè-ha nile: unu gēme kwa ka ha nēlekọta ibu-ha nile n'ihe-ndebe-ha. 28 Nka bu òfùfè nke ab͕uru nile nke umu ndi Giashon n'ulo-ikwū nzute: ihe-ndebe-ha gādi n'aka Itama nwa Eron, bú onye-nchu-àjà. 29 Umu Merari, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, ka i gāgukọta kwa ha; 30 site n'onye b͕ara orú arọ na iri we gaba n'iru we rue onye b͕ara ọgu arọ abua na iri ka i gāgukọta ha, onye ọ bula nke nābakuru usu-ndi-agha, ifè òfùfè nke ulo-ikwū nzute. 31 Nka bu kwa ihe-ndebe nke ibu-ha, dika òfùfè-ha nile si di n'ulo-ikwū nzute; ibo nile nke ebe-obibim, na nkpọrọ-ya nile, na ide-ya nile, na ukwu-ya nile; 32 na ide nile nke ogige ahu buruburu, na ukwu nile ha, na ǹtú nile ha, na udọ̀ nile ha, tiyere ihe-ha nile, tiyere kwa òfùfè-ha nile: n'aha n'aha ka unu gāgukọta ihe nke ihe-ndebe nke ibu-ha. 33 Nka bu òfùfè nke ab͕uru nile nke umu Merari, dika òfùfè-ha nile si di, n'ulo-ikwū nzute, n'aka Itama nwa Eron, bú onye-nchu-àjà. 34 Moses na Eron na ndi-isi nzukọ Israel we gukọta umu ndi Kohat dika ab͕uru nile ha si di, na dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, 35 site n'onye b͕ara orú arọ na iri gaba n'iru we rue onye b͕ara ọgu arọ abua na iri, onye ọ bula nke nābakuru usu-ndi-agha, ifè òfùfè n'ulo-ikwū nzute: 36 ndi-ha agukọtara agukọta, dika ab͕uru nile ha si di, di nnù isi na ọgu iri-na-asa na iri. 37 Ndia bu ndi agukọtara agukọta nke ab͕uru nile nke ndi Kohat, onye ọ bula nke nēfè òfùfè n'ulo-ikwū nzute, ndi Moses na Eron gukọtara n'okwu-ọnu Jehova n'aka Moses. 38 Ndi agukọtara agukọta nke umu Giashon, dika ab͕uru nile ha si di, na dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, 39 site n'onye b͕ara orú arọ na iri we gaba n'iru we rue onye b͕ara ọgu arọ abua na iri, onye ọ bula nke nābakuru usu-ndi-agha, ifè òfùfè n'ulo-ikwū nzute, 40 ọbuná ndi-ha agukọtara agukọta, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, di nnù isi na ọgu iri-na-otù na iri. 41 Ndia bu ndi agukọtara agukọta nke ab͕uru nile nke umu Giashon, onye ọ bula nke n-efè òfùfè n'ulo-ikwū nzute, ndi Moses na Eron gukọtara n'okwu-ọnu Jehova. 42 Ndi agukọtara agukọta nke ab͕uru nile nke umu Merari, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, 43 site n'onye b͕ara orú arọ na iri we gaba n'iru we rue onye b͕ara ọgu arọ abua na iri, onye ọ bula nke nābakuru usu-ndi-agha, ifè òfùfè n'ulo-ikwū nzute, 44 ọbuná ndi-ha agukọtara agukọta, dika ab͕uru nile ha si di, di nnù asatọ. 45 Ndia bu ndi agukọtara agukọta nke ab͕uru nile umu Merari, ndi Moses na Eron gukọtara n'okwu-ọnu Jehova n'aka Moses. 46 Ndi nile agukọtara agukọta nke ndi Livai, ndi Moses na Eron na ndi-isi Israel gukọtara, dika ab͕uru nile ha si di, na dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, 47 site n'onye b͕ara orú arọ na iri we gaba n'iru we rue onye b͕ara ọgu arọ abua na iri, onye ọ bula nke nābà ifè òfùfè, na òfùfè nke ibu n'ulo-ikwū nzute, 48 ọbuná ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù na otù nnù na ọgu iteghete. 49 N'okwu-ọnu Jehova ka agukọtara ha n'aka Moses, nwoke ọ bula dika ibu-ya si di: bú ndi-ya agukọtara agukọta, dika Jehova nyere Moses iwu.

Ọnu-Ọgugu 5

1 Jehova we gwa Moses okwu, si, 2 Nye umu Israel iwu, ka ha chupu n'ọmuma-ulo-ikwū onye-ekpenta ọ bula na onye ọ bula nwere orùrù, na onye ọ bula ruru árú site na madu nwuru anwu: 3 ma nwoke ma nwayi, unu gāchupu ha, n'azu ọmuma-ulo-ikwū ka unu gāchupu ha je; ka ha we ghara imeru ọmuma-ulo-ikwū-ha, nke Mu onwem bi n'etiti ha. 4 Umu Israel we me otú a, chupu ha je n'azu ọmuma-ulo-ikwū: dika Jehova gwara Moses okwu, otú a ka umu Israel mere. 5 Jehova we gwa Moses okwu, si, 6 Gwa umu Israel okwu, si, Nwoke ma-ọbu nwayi, mb͕e ha gēme ihe nime nmehie nile nke madu, imekpu ihe-nmekpu megide Jehova, ikpe ewe ma nkpuru-obi ahu; 7 ha gēkwuputa kwa nmehie-ha nke ha meworo: ọ gēnyeghachi kwa ihe ikpe mara ya nime ya n'isi-ya, ọ bu kwa otù uzọ n'uzọ ise ya ka ọ gātukwasi ya, nye onye ahu ikpe mara ya bayere ya. 8 Ma ọ buru na nwoke ahu enweghi onye-nb͕aputa nke ọ gēnyeghachi ihe ahu nke ikpe mara ya nime ya, ihe ahu ikpe mara ya nime ya nke anēnyeghachi Jehova, onye-nchu-àjà gēnwe ya; nāgughi ebulu nke nkpuchi-nmehie, nke agēji kpuchiri ya nmehie-ya. 9 Ajà-nbuli ọ bula nke ihe nsọ nile nke umu Israel, nke ha nēweta nso onye-nchu-àjà, ọ bu ya gēnwe ya. 10 Ihe nsọ nile nke nwoke ọ bula, o bu ya gēnwe ha; ihe nwoke ọ bula gēnye onye-nchu-àjà, ọ bu ya gēnwe ya. 11 Jehova we gwa Moses okwu, si 12 Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e nwunye nwoke ọ bula gējehie, we mekpue ihe-nmekpu megide ya, 13 ya na nwoke ọzọ ewe dina ka ọ ra aru n'aru-ya, ewe zopu ihe ahu n'anya di-ya kpuchi kwa ya, nwayi ahu ewe rua árú, ma ọ dighi onye-àmà megide ya, ejideghi kwa nwayi ahu; 14 mọ ekworo ewe garue nwoke ahu aru, o we kwo nwunye-ya ekworo, nwayi ahu ewe rua áru: ma-ọbu mb͕e mọ ekworo gāgarue ya arú, o we kwo nwunye-ya ekworo, ma nwayi ahu arughi árú: 15 nwoke ahu gēme kwa ka nwunye-ya biakute onye-nchu-àjà, ọ gēweta kwa n'ihi nwunye-ya onyinye-ya iji biaru nso, bú otù uzọ n'uzọ iri nke ephah utu ọka barley; ọ gaghi-awukwasi ya manu, ọ gaghi-atukwasa ya frankincense; n'ihi na onyinye-inata-iru-ọma nke ekworo ka ọ bu, bú onyinye-inata-iruọma nke ihe-ncheta, nēme ka echeta ajọ omume. 16 Onye-nchu-àjà gēme kwa ka ọ biarue nso, guzo ya n'iru Jehova: 17 onye-nchu-àjà gēwere kwa miri nsọ n'iko ájá: ọ bu kwa ufọdu nime ájá nke di n'ala-ulo ebe-obibim ka onye-nchu-àjà gēwere, tiye ya nime miri ahu: 18 onye-nchu-àjà gēguzo kwa nwayi ahu n'iru Jehova, tọpu agiri-isi nwayi ahu, tiye onyinye-inata-iru-ọma nke ihe-ncheta n'ọbu-aka-ya abua, onyinye-inata-iru-ọma nke ekworo ka ọ bu: ma n'aka onye-nchu-àjà ka miri ilu ahu gādi nke nēweta ọbubu-ọnu: 19 onye-nchu-àjà gēme kwa ka ọ ṅua iyi, ọ gāsi nwayi ahu, Ọ buru na gi na nwoke edinaghi, ọ buru kwa na i jehieghi ime ihe ruru árú, mb͕e i nọ n'okpuru di-gi, gi pua na miri ilu a nke nēweta ọbubu-ọnu: 20 ma asi na gi onwe-gi ejehiewo, mb͕e i nọ n'okpuru di-gi, asi kwa na i rua árú, nwoke nābughi di-gi ewe ra aru n'aru-gi: 21 onye-nchu-àjà gēwere kwa iyi nke ọb͕ub͕a-iyi ahu me ka nwayi ahu ṅua iyi, onye-nchu-àjà gāsi nwayi ahu, Jehova gēme gi ka i buru ihe-ọb͕ub͕a-iyi ka i buru kwa ihe-oṅuṅu-iyi n'etiti ndi-gi, mb͕e Jehova nēme ka apata-ukwu-gi bua aru, me kwa ka afọ-gi za aza; 22 miri a nke nēweta ọbubu-ọnu gābà kwa na ngiri-afọ-gi, ime ka afọ-gi za aza, na ime ka apata-ukwu-gi bua aru: nwayi ahu gāsi kwa, Amen, Amen. 23 Onye-nchu-àjà gēde kwa ọb͕ub͕a-iyi ndia n'akwukwọ, o gēhichapu kwa ha nime miri ilu ahu: 24 ọ gēme kwa ka nwayi ahu ṅua miri ilu nke nēweta ọbubu-ọnu: miri ahu nke nēweta ọbubu-ọnu gābà kwa nime ya ighọ ihe-ilu. 25 Onye-nchu-àjà gānara kwa onyinye-inata-iru-ọma nke ekworo n'aka nwayi ahu, fé onyinye-inata-iru-ọma ahu n'iru Jehova, weta ya nso ebe-ichu-àjà: 26 onye-nchu-àjà gēsi kwa n'onyinye-inata-iru-ọma ahu weju nweju-aka-ya, ka ọ buru ihe-ncheta-ya, o gēsure kwa ya ọku ibu ihe nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà, emesia ọ gēme ka nwayi ahu ṅua miri ahu. 27 Ma mb͕e ọ meworo ka ọ ṅua miri ahu, ọ gēru kwa ọ buru na ọ rua árú, mekpu ihe-nmekpu megide di-ya, na miri ahu nke nēweta ọbubu-ọnu gābà nime ya ighọ ihe-ilu, afọ-ya gāza kwa, apata-ukwu-ya gābu kwa aru: nwayi ahu gābu kwa ihe-ọb͕ub͕a-iyi n'etiti ndi-ya. 28 Ma ọ buru na nwayi ahu arughi árú, ma onye di ọcha ka ọ bu; ọ gāpu kwa ya, we turu ime. 29 Nka bu iwu ekworo, mb͕e nwayi nējehie, mb͕e ọ nọ n'okpuru di-ya, ọ we rua árú; 30 ma-ọbu mb͕e mọ ekworo gāgaru nwoke n'aru, ọ we kwo nwunye-ya ekworo; o gēguzo kwa nwayi ahu n'iru Jehova, onye-nchu-àjà gēme kwa ya iwu a nile. 31 Nwoke ahu gāpu kwa n'ajọ omume, ma nwayi gēbu ajọ omume-ya.

Ọnu-Ọgugu 6

1 Jehova we gwa Moses okwu, si, 2 Gwa umu Israel okwu, si ha, Nwoke ma-ọbu nwayi, mb͕e ọ gālu oké ọlu n'ikwe nkwa onye-Nazirait, ikewaputara Jehova onwe-ya: 3 na manya-vine na ihe-ọṅuṅu nābà n'anya ka ọ gēkewaputa onwe-ya; ọ gaghi-aṅu manya-vine b͕ara uka, ma-ọbu ihe- ọṅuṅu nābà n'anya b͕ara uka, ọ gaghi-aṅu kwa miri nkpuru-vine ọ bula, ọ gaghi-eri kwa nkpuru-vine ọhu ma-ọbu nke amikọrọ amikọ. 4 Ubọchi nile nke nkewaputa-ya ọ dighi ihe nime ihe ọ bula emere site n'osisi vine nke manya-vine o gēri, site na nkpuru-ime-ya we rue mb͕ub͕ọ-ya. 5 Ubọchi nile nke nkwa nkwaputa-ya ọ dighi aguba gāgabiga n'isi-ya: rue ozùzù ubọchi nile, nke ọ nēkewaputara Jehova onwe-ya nsọ ka ọ gādi, ọ gēme ka ntutu agiri-isi-ya to ogologo. 6 Ubọchi nile ọ nēkewaputara Jehova onwe-ya ọ dighi madu nwuru anwu ọ gābiaru nso. 7 Ọ gaghi-emeru onwe-ya bayere nna-ya, ma-ọbu bayere nne-ya, ma-ọbu bayere nwa-nne-ya nwoke, maọbu bayere nwa-nne-ya nwayi, mb͕e ha nwuru; n'ihi na nkewaputa Chineke-ya di n'isi-ya. 8 Ubọchi nile nke nkewaputa-ya nsọ ka ọ diri Jehova. 9 Ma mb͕e onye nwuru anwu gānwu n'akuku-ya na ntabi-anya, na mberede, o we merua isi nkewaputa-ya; ọ gākọpu kwa isi-ya n'ubọchi anēme ya ka ọ di ọcha, n'ubọchi nke-asa ka ọ gakọpu ya. 10 N'ubọchi nke-asatọ ọ gēwetara onye-nchu-àjà nduru abua, ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua, rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute. 11 Onye-nchu-àjà gēme otù ka ọ buru àjà-nmehie, me kwa nke-ọzọ ka ọ buru àjà-nsure-ọku, o gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya, n'ihi nmehie nke ọ mehiere site na madu ahu nwuru anwu, o gēdo kwa isi-ya nsọ n'ubọchi ahu. 12 Ọ gēkewaputa-kwa-ra Jehova ubọchi nile nke nkewaputa-ya, weta kwa nwa-ebulu b͕ara otù arọ ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma: ma ubọchi mbu nile alawo n'iyì, n'ihi na nkewaputa-ya ruru árú. 13 Nka bu kwa iwu onye-Nazirait, n'ubọchi ozùzù nke ubọchi nile nke nkewaputa-ya: agēme ka ọ bia n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute: 14 ọ gēweta kwa nso Jehova onyinye-ya iji biaru nso, otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, nke zu-kwa-ra okè, ka ọ buru àjà-nsure-ọku, na otù nwa-nne-aturu nke b͕ara otù arọ, nke zu-kwa-ra okè, ka ọ buru àjà-nmehie, na otù ebulu zuru okè ka ọ buru àjà-udo, 15 na nkata achicha ekoghi-eko, ob͕e achicha nke utu ọka flour agwara manu, na mbadamba-achicha ekoghi-eko ufọdu nke etere manu, na onyinye-inata-iruọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha. 16 Onye-nchu-àjà gēweta kwa ha nso n'iru Jehova, me àjà-nmehie-ya, na àjà-nsure-ọku-ya: 17 ọ gēme kwa ebulu ahu ka ọ buru ihe àjà nke àjà-udo anāchuru Jehova, tiyere nkata achicha ekoghi-eko ahu: onye-nchu-àjà gēme kwa onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya. 18 Onye-Nazirait ahu gākọpu kwa isi nke nkewaputa-ya n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, ọ gēwere kwa agiri-isi nke isi nke nkewaputa-ya, tiye ya n'elu ọku nke di n'okpuru ihe àjà nke àjà-udo ahu. 19 Onye-nchu-aja gēwere ọkwa-aka esiri esi nke ebulu ahu, na otù ob͕e achicha ekoghi-eko sitere na nkata ahu, na otù mbadamba-achicha ekoghi-eko, tiye ha n'elu ọbu-aka abua nke onye-Nazirait ahu, mb͕e ọ kọpusiri isi nke nkewaputa-ya: 20 onye-nchu-àjà gēfé kwa ha ibu àjà-ofufé n'iru Jehova; ihe nsọ ka ọ buru onye-nchu-àjà, tiyere okpukpu-obi nke àjà-ofufé, tiye-kwa-ra utaku-ukwu nke àjà-nbuli: emesia onye-Nazirait ahu gāṅu manya-vine. 21 Nka bu iwu onye-Nazirait onye nēkwe nkwa, na nke onyinye-ya iji biarue Jehova nso bayere nkewaputa-ya, nāgughi ihe aka-ya gēru: dika nkwa-ya si di, nke ọ nekwe, otú a ka ọ gēme n'iwu nkewaputa-ya. 22 Jehova we gwa Moses okwu, si, 23 Gwa Eron, gwa kwa umu-ya ndikom, okwu, si Otú a ka unu gāgọzi umu Israel; unu gāsi ha, 24 Jehova gọzie gi, debe gi: 25 Jehova me iru-Ya ka ọ mukwasi gi, Jehova me-kwa-ra gi amara: 26 Jehova bulie iru-Ya n'aru gi, nye gi udo. 27 Ha gātukwasi kwa aham n'aru umu Israel; Mu onwem gāgọzi kwa ha.

Ọnu-Ọgugu 7

1 O rue, n'ubọchi Moses guzosiri ebe-obibi ahu, te ya manu, do ya nsọ, na ihe-ya nile, na ebe-ichu-àjà na ihe-ya nile, mb͕e ọ tesiri ha manu, do ha nsọ; 2 na ndi-isi Israel, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha, wetara ihe nso; ndi ahu bu ndi-isi ebo nile, ndi ahu bu ndi nēguzo n'isi ndi agukọtara agukọta: 3 ha we weta onyinye-ha iji biaru nso n'iru Jehova, ugbala isi nwere ihe-okpukpu, na ehi iri na abua; otù ugbala diri ndi-isi abua, otù ehi di-kwa-ra otù onye: ha we weta ha nso n'iru ebe-obibi ahu. 4 Jehova we gwa Moses okwu, si, 5 Nara ha n'aka-ha, ka ha we buru ihe iji fè òfùfè nke ulo-ikwū nzute; i gēwere kwa ha nye ndi Livai, nwoke ọ bula dika òfùfè-ya si di. 6 Moses we nara ugbala nile na ehi nile, nye ha ndi Livai. 7 Ugbala abua na ehi anọ ka o nyere umu Giashon, dika òfùfè-ha si di: 8 ugbala anọ na ehi asatọ ka o nye-kwa-ra umu Merari, dika òfùfè-ha si di, n'aka Itama nwa Eron, bú onye-nchu-àjà. 9 Ma ọ nyeghi umu Kohat: n'ihi na òfùfè nke ebe nsọ dikwasi ha; n'ubu ka ha nēbu ya. 10 Ndi-isi we weta nso onyinye irara ebe-ichu-àjà nye Chineke n'ubochi etere ya manu, ndi-isi ahu we weta nso onyinye-ha iji biaru nso n'iru ebe-ichu-àjà. 11 Jehova we si Moses, Otù onye-isi otù ubọchi, otù onye-isi otù ubọchi, ka ha gēweta nso onyinye-ha iji biaru nso, bayere ira ebe-ichu-àjà nye Chineke. 12 Onye nēweta nso onyinye-ya iji biaru nso n'ubọchi mbu bu Nahshon nwa Aminadab, nke ebo Juda: 13 onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma; 14 na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ; 15 na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku; 16 na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie; 17 na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Nahshon nwa Aminadab. 18 N'ubọchi nke-abua Netanel nwa Zua, onye-isi Isaka, wetara ihe-ya nso: 19 o wetara nso onyinye-ya iji biaru nso: otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma; 20 na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; 21 na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku; 22 na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie; 23 na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Netanel nwa Zua. 24 N'ubọchi nke-atọ onye-isi umu Zebulun nwere, bú Eliab nwa Hilon, wetara ihe-ya nso; 25 onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma; 26 na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; 27 na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku; 28 na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie; 29 na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Eliab nwa Hilon. 30 N'ubọchi nke-anọ onye-isi umu Reuben nwere, bú Elizua nwa Shedeua, wetara ihe-ya nso: 31 onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma; 32 na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; 33 na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku; 34 na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie; 35 na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù, arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Elizua nwa Shedeua. 36 N'ubọchi nke-ise onye-isi umu Simeon nwere, bú Shelumiel nwa Zurishadai, wetara ihe-ya nso: 37 onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma; 38 na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; 39 na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku; 40 na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie; 41 na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Shelumiel nwa Zurishadai. 42 N'ubọchi nke-isi onye-isi umu Gad nwere, bú Eliasaf nwa Deuel, wetara ihe-ya nso: 43 onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma; 44 na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure- ọku nēsì ísì utọ; 45 na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku; 46 na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie; 47 na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Eliasaf nwa Deuel. 48 N'ubọchi nke-asa onye-isi umu Efraim nwere, bú Elishama nwa Amihud, wetara ihe-ya nso: 49 onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma; 50 na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; 51 na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku; 52 na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie; 53 na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Elishama nwa Amihud. 54 N'ubọchi nke-asatọ onye-isi umu Manase nwere, bú Gameliel nwa Pedahzua, wetara ihe-ya nso: 55 onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ iri na n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma; 56 na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; 57 na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku; 58 na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie; 59 na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Gameliel nwa Pedahzua. 60 N'ubọchi nke-iteghete onye-isi umu Benjamin nwere, bú Abidan nwa Gideoni, wetara ihe-ya nso: 61 onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma; 62 na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ; 63 na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure ọku; 64 na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie; 65 na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Abidan nwa Gideoni. 66 N'ubọchi nke-iri onye-isi umu Dan nwere, bú Ahieza nwa Amishadai, wetara ihe-ya nso: 67 onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù- ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma; 68 na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; 69 na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu; nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku; 70 na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie: 71 na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Ahieza nwa Amishadai. 72 N'ubọchi nke iri-na-otù onye-isi umu Asha nwere, bú Pagiel nwa Ọkran, wetara ihe-ya nso: 73 onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọlaọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma; 74 na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; 75 na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku; 76 na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie; 77 na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Pagiel nwa Ọkran. 78 N'ubọchi nke-iri-na-abua onye-isi umu Naftali nwere, bú Ahira nwa Inan, wetara ihe-ya nso: 79 onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di: ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma; 80 na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputura n'ihe-nsure-ọku; nēsì ísì utọ; 81 na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku; 82 na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie; 83 na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Ahira nwa Inan. 84 Nka bu onyinye nke ira ebe-ichu-àjà nye Chineke, n'ubọchi etere ya manu, site n'aka ndi-isi Israel: afere ọla-ọcha iri na abua, na ọkwa-nwusa ọla-ọcha iri na abua, na ngaji ọla-edo iri na abua: 85 afere ọla-ọcha ọ bula di ọgu shekel isi na iri n'ọtùtù, ọkwa-nwusa ọ bula di kwa ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù: ọla-ọcha nile nke ihe nile di nnù shekel isi n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; 86 ngaji ọla-edo iri na abua ahu, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ, ha di shekel iri shekel iri n'ọtùtù-ha, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di: ọla-edo nile nke ngaji di ọgu shekel isi n'ọtùtù-ha: 87 ehi nile iji chu àjà-nsure-ọku di oke-ehi iri na abua, ebulu-ya di iri na abua, umu-ebulu-ya nke b͕ara otù arọ di iri na abua, na onyinye-inata-iru-ọma-ha: nkpi iji chu àjà-nmehie di iri na abua: 88 ehi nile nke ihe àjà nke àjà-udo di orú oke-ehi na anọ, ebulu-ya di ọgu atọ, nkpi-ya di ọgu atọ, umu-ebulu-ya nke b͕ara otù arọ di ọgu atọ. Nka bu onyinye nke irara ebe-ichu-àjà nye Chineke, mb͕e etesiri ya manu. 89 Ma mb͕e Moses bara n'ulo-ikwū nzute ikpayere Ya uka, ọ we nu Olu ahu ka Ọ nāgwa ya okwu site n'elu ebe-nkpuchi-nmehie nke di n'elu ib͕e ihe-àmà ahu, site n'etiti cherubim abua ahu: O we gwa ya okwu.

Ọnu-Ọgugu 8

1 Jehova we gwa Moses okwu, si, 2 Gwa Eron okwu, si ya, Mb͕e i nēweli oriọna asa ahu, na ncherita-iru nke iru ihe-idọba-oriọna ka oriọna asa ahu gēnye ìhè. 3 Eron we me otú a; na ncherita-iru nke iru ihe-idọba-oriọna ahu ka o weliri oriọna-ya nile, dika Jehova nyere Moses iwu. 4 Nka bu otú emere ihe-idọba-oriọna ahu, ihe akpuru akpu nke ọla-edo ka ọ bu; rue ukwu-ala-ya, ru kwa okoko-ya nile, ihe akpuru akpu ka ọ bu: dika ihe-ile-anya ahu si di nke Jehova mere ka Moses hu, otú a ka o mere ihe-idọba-oriọna ahu. 5 Jehova we gwa Moses okwu, si, 6 Weputa ndi Livai n'etiti umu Israel, me ka ha di ọcha. 7 Otú a ka i gēme ha, ime ka ha di ọcha: fesa ha miri nāsachapu nmehie, ka ha me kwa ka aguba gabiga n'anu-aru-ha nile, ka ha su kwa uwe-ha, me kwa onwe-ha ka ha di ọcha. 8 Ka ha were kwa nwa-oke ehi, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, bú utu ọka flour agwara manu, nwa-oke-ehi ọzọ ka i gēwere kwa iji chu àjà-nmehie. 9 I gēme kwa ka ndi Livai biaru nso n'iru ulo-ikwū nzute: i gākpọkọta kwa nzukọ nile nke umu Israel: 10 i gēme kwa ka ndi Livai biaru nso n'iru Jehova: umu Israel gēbikwasi ndi Livai aka-ha: 11 Eron gēfé ndi Livai n'iru Jehova ibu àjà-ofufé sitere n'umu Israel, ka ha we buru ndi gēfè òfùfè nke Jehova. 12 Ndi Livai gēbikwasi aka-ha n'isi oke-ehi abua ahu: gi me otù nime ha ka ọ buru àjà-nmehie, me ibe-ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku, ichuru Jehova, ikpuchiri ndi Livai nmehie-ha. 13 I gēguzo ndi Livai n'iru Eron, na n'iru umu-ya ndikom, fé kwa ha ka ha buru àjà-ofufé ichuru Jehova. 14 I gēkewaputa kwa ndi Livai n'etiti umu Israel, ndi Livai gābu kwa ihe M'nwere. 15 Emesia ndi Livai gābà ifè ulo-ikwū nzute òfùfè: i gēme ka ha di ọcha, fé kwa ha ibu àjà-ofufé. 16 N'ihi na ndi enyesiworom ha nile ka ha bu site n'etiti umu Israel; n'ọnọdu umu nile ọ bula meghere àkpà-nwa, bú umu eburu uzọ muru madu nile nke umu Israel, ka M'wereworo ha n'Onwem. 17 N'ihi na Mu nwe umu nile eburu uzọ mu n'etiti umu Israel, ma n'etiti mmadu ma n'etiti anu-ulo: n'ubọchi m'tib͕uru umu nile eburu uzọ mu n'ala Ijipt ka M'doro ha nsọ nye Onwem. 18 Ewerewokwam ndi Livai n'ọnọdu umu nile eburu uzọ mu n'etiti umu Israel. 19 Ewerewom ndi Livai nye Eron, nye kwa umu-ya ndikom, dika ndi enyere enye, site n'etiti umu Israel, ifè òfùfè nke umu Israel n'ulo-ikwū nzute, na ikpuchiri umu Israel nmehie-ha: ka ihe-otiti we ghara idi n'etiti umu Israel, n'ibiaru-nso nke umu Israel nābiaru ebe nsọm. 20 Moses, na Eron, na nzukọ nile nke umu Israel, we me ndi Livai otú a: dika ihe nile si di nke Jehova nyere Moses n'iwu bayere ndi Livai, otú a ka umu Israel mere ha. 21 Ndi Livai we wepu nmehie n'onwe-ha, su uwe-ha; Eron we fé ha ka ha buru àjà-ofufé n'iru Jehova; Eron we kpuchiere ha nmehie-ha ime ka ha di ọcha. 22 Emesia ndi Livai we ba ifè òfùfè-ha n'ulo-ikwū nzute n'iru Eron, na n'iru umu-ya ndikom: dika Jehova nyere Moses iwu bayere ndi Livai, otú a ka ha mere ha. 23 Jehova we gwa Moses okwu, si 24 Nka bu nke ndi Livai nwere: site n'onye b͕ara orú arọ na ise we gaba n'iru ha gābà ibu agha n'òfùfè nke ulo-ikwū nzute: 25 ma site n'onye b͕ara ọgu arọ abua na iri we gaba n'iru ha gēsi n'ibu-agha nke òfùfè ahu laghachi, ha agaghi-efè ọzọ; 26 ma ha gēso umu-nne-ha je ozi n'ulo-ikwū nzute, idebe ihe-ndebe, ma ọ dighi òfùfè ha gēfè. Otú a ka i gēme ndi Livai n'ihe-ndebe-ha.

Ọnu-Ọgugu 9

1 Jehova we gwa Moses okwu n'ọzara Sainai, n'arọ nke-abua nke nputa ha si n'ala Ijipt puta, n'ọnwa mbu, si, 2 Ka umu Israel me kwa ememe ngabiga na mb͕e-ya akara àkà. 3 N'ubọchi nke-iri-na-anọ n'onwa nka, n'etiti ehihie na anyasi, ka unu gēme ya na mb͕e-ya akara àkà: dika ukpuru-ya nile si di, na dika ikpé-ya nile si di, ka unu gēme ya. 4 Moses we gwa umu Israel okwu, si ha me ememe ngabiga ahu. 5 Ha we me ememe ngabiga ahu n'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu, n'etiti ehihie na anyasi, n'ọzara Sainai: dika ihe nile si di nke Jehova nyere Moses n'iwu, otú a ka umu Israel mere. 6 Ma ndikom ufọdu di, ndi bu ndi ruru árú site n'ozu madu, ha apughi kwa ime ememe ngabiga ahu n'ubọchi ahu: ha we biaru nso n'iru Moses na n'iru Eron n'ubọchi ahu: 7 ndikom ahu we si ya, Ayi onwe-ayi bu ndi ruru árú site n'ozu madu: n'ihi gini ka anēb͕ochi ayi ka ayi we ghara iweta nso onyinye iji biaru nso Jehova na mb͕e-ya akara àkà n'etiti umu Israel? 8 Moses we si ha, Guzonu; ka m'we nu ihe Jehova gēnye n'iwu bayere unu. 9 Jehova we gwa Moses okwu, si, 10 Gwa umu Israel okwu, si, Nwoke ọ bula n'etiti unu ma-ọbu n'etiti ọb͕ọ-unu nile, mb͕e ọ gāru árú site na madu nwuru anwu, ma-ọbu mb͕e ọ nọ n'ije di anya, ọ gēme-kwa-ra Jehova ememe ngabiga: 11 n'ọnwa nke-abua n'ubọchi nke-iri-na-anọ n'etiti ehihie na anyasi ka ha gēme ya; tiyere achicha ekoghi-eko na ihe di iche iche nēlu ilu ka ha gēri ya: 12 ha agaghi-eme ka ihe fọdu site na ya rue ututu, ọ dighi kwa ọkpukpu ha gētiji nime ya: dika ukpuru nile nke ngabiga ahu si di ka ha gēme ya. 13 Ma nwoke nke di ọcha, nke nānọghi kwa n'ije, ma ọ rapuwo ime ememe ngabiga, agēbipu kwa madu ahu n'etiti umu-nna-ya: n'ihi a o wetaghi nso onyinye iji biaru nso Jehova na mb͕e-ya akara àkà, nwoke ahu gēbu nmehie-ya. 14 Ma mb͕e ọbìa gānọ n'etiti unu dika ọbìa, me-kwa-ra Jehova ememe ngabiga; dika ukpuru ngabiga ahu si di, na dika ikpé-ya si di, otú a ka ọ gēme: otù ukpuru ka unu gēnwe, ma ọbìa, ma onye amuru n'ala. 15 N'ubọchi eguzoro ebe-obibi ahu ọtọ igwe-oji ahu kpuchiri ebe-obibi, ọbuna ulo-ikwū nzute: ma n'anyasi ọ di n'elu ebe-obibi ahu dika ọku, n'ile ya anya, rue ututu. 16 Otú a ka ọ di mb͕e dum: igwe-oji ahu nēkpuchi ya, ya na ọku n'abali, n'ile ya anya. 17 Ma ọ di ka nrigo nke igwe-oji ahu site n'elu Ulo-ikwū si di, emesia umu Israel we bulie ije: ọ bu kwa n'ebe igwe-oji ahu bi, n'ebe ahu ka umu Israel nāma ulo-ikwū-ha. 18 N'okwu-ọnu Jehova ka umu Israel nēbuli ije, ọ bu kwa n'okwu-ọnu Jehova ka ha nāma ulo-ikwū-ha: ubọchi nile igwe-oji ahu nēbi n'elu ebe-obibi ahu ha nānọdu n'ọmuma-ulo-ikwū. 19 Mb͕e igwe-oji ahu nānọgide n'elu ebe-obibi ahu ọtutu ubọchi, umu Israel we debe ihe-ndebe nke Jehova, ha ebulighi kwa ije. 20 Mb͕e ufọdu di mb͕e igwe-oji ahu nānọ ubọchi ole-na-ole n'elu ebe-obibi ahu; n'okwu-ọnu Jehova ka ha nānọdu n'ọmuma-ulo-ikwū, ọ bu kwa n'okwu-ọnu Jehova ka ha nēbuli ije. 21 Mb͕e ufọdu di kwa mb͕e igwe-oji ahu nānọ site n'anyasi rue ututu; ma mb͕e igwe-oji ahu rigoro n'ututu, ha we bulie ije: ma n'ehihie ma n'abali, mb͕e igwe-oji ahu rigoro, ha we bulie ije. 22 Ma asi na ọ bu ubọchi abua, ma-ọbu otù ọnwa, ma-ọbu otù arọ, ka igwe-oji ahu nānọgide n'elu ebe-obibi ahu, ibi n'elu ya, umu Israel nānọdu n'ọmuma-ulo-ikwū-ha, ha ebulighi kwa ije: ma mb͕e emere ka ọ rigo, ha buliri ije. 23 N'okwu-ọnu Jehova ha nāma ulo-ikwū-ha, ọ bu kwa n'okwu-ọnu Jehova ka ha nēbuli ije: ihe-ndebe nke Jehova ka ha debere, n'okwu-ọnu Jehova n'aka Moses.

Ọnu-Ọgugu 10

1 Jehova we gwa Moses okwu, si, 2 Mere onwe-gi opì ọla ọcha abua; ihe akpuru akpu ka i gēme ha: ha gābu-kwa-ra gi ihe bayere nkpọkọta nzukọ Israel, na ihe bayere nbuli-ije nke omuma-ulo-ikwū nile ha. 3 Mb͕e ha gēwere ha fùa, nzukọ Israel nile gēzukọ n'ebe i nọ rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute. 4 Ma ọ buru na otù ka ha were fùa, ndi-isi, bú ndi-isi nke usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Israel, gēzukọ kwa n'ebe i nọ. 5 Mb͕e unu gāfù opì ka ọ we dasie uda ike, ọmuma-ulo-ikwū nile nke nāma ulo-ikwū-ha n'akuku Iru-anyanwu gēbuli kwa ije. 6 Mb͕e unu gāfù opì ub͕ò nke-abua ka ọ we dasie uda ike, ọmuma-ulo-ikwū nile nke nāma ulo-ikwū-ha n'akuku Ndida gēbuli kwa ije: ha gāfù opì ka ọ we dasie uda ike bayere nbuli-ije nile ha. 7 Ma n'ikpọkọta nkpọkọta Israel unu gāfù opì, ma unu emela ka ọ dasie uda ike. 8 Ọ bu umu-ndikom Eron, bú ndi-nchu-àjà, gēwere opì abua ahu fua; ha gābu-kwa-ra unu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ nile unu. 9 Ọzọ, mb͕e unu nēbu agha n'ala-unu megide onye-nkpab͕u nākpab͕u unu, unu gēwere opì me ka ha dasie uda ike; agēcheta kwa unu n'iru Jehova, bú Chineke-unu, agāzọputa kwa unu n'aka ndi-iro-unu. 10 Ọ bu kwa n'ubọchi ọṅu-unu, na na mb͕e nile unu akara àkà, na nime nmalite ọnwa nile unu, ka unu gēwere opì abua ahu fùa n'elu àjà-nsure-ọku nile unu, na n'elu ihe àjà nke àjà-udo nile unu; ha gābu-kwa-ra unu ihe-ncheta n'iru Chineke-unu; Mu onwem bu Jehova, Chineke-unu. 11 O rue n'arọ nke-abua, n'ọnwa nke-abua, n'ubọchi nke-orú n'ọnwa ahu, na igwe-oji ahu siri n'elu ebe-obibi nke ihe-àmà ahu rigo. 12 Umu Israel we si n'ọzara Sainai bulie ije dika nbuli-ije nile ha si di; igwe-oji ahu we nọdu n'ọzara Peran. 13 Ma ha buru uzọ bulie ije n'okwu-ọnu Jehova n'aka Moses. 14 Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū umu Juda buru uzọ bulie ije, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: Nahshon nwa Aminadab nọ n'isi usu-ndi-agha-ya. 15 Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Isaka bu Netanel nwa Zua. 16 Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Zebulun bu Eliab nwa Hilon. 17 Ewe weda ebe-obibi ahu; umu Giashon na umu Merari, ndi nēbu ebe-obibi ahu, we bulie ije. 18 Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū Reuben we bulie ije, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: Elizua nwa Shedeua nọ n'isi usu-ndi-agha-ya. 19 Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Simeon bu Shelumiel nwa Zurishadai. 20 Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Gad bu Eliasaf nwa Deuel. 21 Ndi Kohat we bulie ije, nēbu ebe nsọ ahu: ma ndi ọzọ guzoro ebe-obibi ahu ọtọ rue ọbibia-ha. 22 Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū umu Efraim we bulie ije, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: Elishama nwa Amihud nọ n'isi usu-ndi-agha-ya. 23 Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Manase bu Gameliel nwa Pedahzua. 24 Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Benjamin bu Abidan nwa Gideoni. 25 Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū umu Dan, nke nọ n'azu ọmuma-ulo-ikwū nile, we bulie ije, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: Ahieza nwa Amishadai nọ n'isi usu-ndi-agha-ya. 26 Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Asha bu Pagiel nwa Ọkran. 27 Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Naftali bu Ahira nwa Inan. 28 Ndia bu nbuli-ije nke umu Israel, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di; ha we bulie ije. 29 Moses we si Hobab, nwa Reuel onye Midian, bú nna nwunye Moses, Ndi nēbuli ije ka ayi bu rue ebe ahu nke Jehova kwuru okwu bayere ya, si, Nke ahu ka M'gēnye unu: soro ayi je, ayi gēme kwa gi nma: n'ihi na Jehova ekwuwo ezi ihe bayere Israel. 30 Ọ we si ya, M'gaghi-eje; kama alam na umu-nnam ka m'gālakuru. 31 Ọ we si, Biko, arapula ayi; n'ihi na i mara ọmuma-ulo-ikwū-ayi n'ọzara, i gābu-kwa-ra ayi anya. 32 O gēru kwa, mb͕e i soro ayi je, o gēru kwa, na ezi ihe ahu nke Jehova gēme ayi nma ya, ayi gēme kwa gi nma. 33 Ha we si n'ugwu Jehova bulie ije-ha je ije ubọchi atọ; ib͕e ọb͕ub͕a-ndu nke Jehova nēbuli kwa ije n'iru ha ije ubọchi atọ, ileputara ha ebe izu-ike 34 Igwe-oji nke Jehova we di n'elu ha n'ehihie, mb͕e ha si n'ọmuma-ulo-ikwū bulie ije. 35 O rue, nime nbuli-ije ib͕e ahu, na Moses nāsi, Bilie, Jehova, ka ndi-iro-Gi b͕asa; ka ndi nākpọ Gi asì b͕apu kwa n'iru Gi. 36 Ma mb͕e o zuru ike, ọ nāsi, Jehova, laghachikute ọtutu ìgwè madu ndia, bú usu nile nke nnù madu abua na ọgu iri nke Israel.

Ọnu-Ọgugu 11

1 Ndi Israel we di ka ndi nātamu ntamu, nēkwu ihe ọjọ na nti Jehova: Jehova we nu ya, iwe-Ya we di ọku; ọku nke Jehova we re n'etiti ha, we ripia madu ufọdu nime nsọtu ọmuma-ulo-ikwū. 2 Ndi Israel we tikue Moses; Moses we kpere Jehova ọku ahu we bilata. 3 Ewe kpọ aha ebe ahu Tabera: n'ihi na ọku nke Jehova nēre n'etiti ha. 4 Ìgwè ndi gwara ọgwa nke nọ n'etiti ha we chọ ajọ ọchichọ: umu Israel we kwa kwa ákwá ọzọ, si, Ònye gēme ka ayi rie anu? 5 Ayi nēcheta azù nke ayi nēri n'Ijipt nāzughi azú; ya na cucumbers na melons, na leeks, na onions, na garlic: 6 ma ub͕u a nkpuru-obi ayi akpọwo nku, ọ dighi ihe ọ bula ayi nwere: ọ bu nání manna nka di n'iru ayi. 7 Ma manna ahu, dika nkpuru coriander ka ọ bu, iru-ya di kwa ka iru bdellium. 8 Ndi Israel jeghariri, chikọta ya, were nkume-igwe-nri gwe ya, ma-ọbu na ha suru ya n'ikwè, we sie ya n'ite, me ya ka ọ buru ob͕e achicha: idetu ya ire ọ di ka idetu ihe eji manu si esi. 9 Mb͕e igirigi dakwasiri ọmuma-ulo-ikwū ahu n'abali, manna we dakwasi ya. 10 Moses we nu ndi Israel ka ha nākwa ákwá n'ab͕uru nile ha, nwoke ọ bula n'ọnu-uzọ ulo-ikwū-ya: iwe nke Jehova we di ọku nke-uku; ọ jọ-kwa-ra njọ n'anya Moses. 11 Moses we si Jehova, N'ìhi gini ka I ji mejọ orù-Gi? ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka m'nāhutaghi kwa amara n'iru Gi, na I nēbom ibu nke ndi nka nile? 12 Ọ̀ bu mu onwem turu ime ndi nka nile? ọ̀ bu mu onwem muru ha, na I nāsim, Kuru ha n'obi-gi, dika nna-nāzù-nwa si eku nwa nāṅu ara, rue ala ahu nke I ṅuru ndi bu nna-ha iyi inye ha? 13 Òle ebe m'gēsi nwe anu inye ndi nka nile? n'ihi na ha nākwasom ákwá, si, Nye ayi anu, ka ayi we rie. 14 Apughm, nání mu onwem, ikuru ndi nka nile, n'ihi na ọ karirim arọ́. 15 Ma ọ buru na otú a ka Gi onwe-gi nēmem, biko, gbuziem, ọ buru na ahutawom amara n'iru Gi; ka m'ghara kwa ilekwasi ihe ọjọm anya. 16 Jehova we si Moses, Chikọtaram ọgu ndikom atọ na iri sitere na ndi-okenye Israel, ndi i maworo na ha onwe-ha bu ndi-okenye nke ndi Israel, na ndi nēle ha anya n'ọlu: gi chiri ha bia rue ulo-ikwū nzute, ka ha we soro gi guzo onwe-ha n'ebe ahu. 17 M'gāridata, kpayere gi uka n'ebe ahu M'gānara kwa ufọdu nime Mọ ahu nke dikwasi gi, tukwasi ha; ha gēso kwa gi bū ibu ndi Israel, ka i we ghara ibū ya, nání gi onwe-gi. 18 Gi si kwa ndi Israel, Do onwe-unu nsọ bayere echi, unu gēri kwa anu: n'ihi na unu akwawo ákwá na nti Jehova, si, Ònye gēme ka ayi rie anu? n'ihi na ọ diri ayi nma n'Ijipt: Jehova gēnye kwa unu anu, unu gēri kwa. 19 Ọ bughi otù ubọchi ka unu gēri anu, ọ bughi ubọchi abua, ọ bughi ubọchi ise, ọ bughi ubọchi iri, ọ bughi orú ubọchi; 20 rue otù ọnwa zuru ezù, rue mb͕e o gēsi n'imi-unu puta, ọ we ghọrọ unu ihe-isọ-oyi: n'ihi na unu ajuwo Jehova Nke nọ n'etiti unu, unu we kwa ákwá n'iru Ya, si, N'ìhi gini kwa ka ayi siworo n'Ijipt puta? 21 Moses we si, Orú nnù ndikom ọgu uzọ atọ na orú nnù uzọ iri-na-ise ndi ji ukwu eje ka ndi ahu di, bú ndi mu onwem nọ n'etiti ha: ma Gi onwe-gi asiwo, Anu ka M'gēnye ha, ka ha we rie otù ọnwa zuru ezù. 22 Ọ̀ bu ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi ka agēb͕uru ha, ka o we zue ha? ọ̀ bu azù nile nke oké osimiri ka agāchikọtara ha, ka o we zue ha? 23 Jehova we si Moses, Aka Jehova, ọ̀ ghọwo nkpunkpu aka? ub͕u a ka i gāhu ma okwum gērere gi ma-ọbu na ọ gaghi-ere. 24 Moses we pua, gwa ndi Israel okwu nile nke Jehova: o we chikọta ọgu ndikom atọ na iri sitere na ndi-okenye nke ndi Israel, guzo ha buruburu Ulo-ikwū ahu. 25 Jehova we ridata n'igwe-oji ahu, gwa ya okwu, nara ufọdu nime Mọ ahu nke dikwasiri ya, tiyekwasi n'ọgu ndi-okenye atọ na iri ahu: o rue, mb͕e Mọ ahu bekwasiri ha, na ha buru amuma, ma ha emeghi ya ọzọ. 26 Ma ndikom abua fọduru n'ọmuma-ulo-ikwū, aha nke otù onye nime ha bu Eldad, aha nke ibe-ya bu Midad: Mọ ahu we bekwasi ha; ha onwe-ha di kwa n'etiti ndi edere aha-ha n'akwukwọ, ma ha apughi jerue Ulo-ikwū ahu: ha we bū amuma n'ọmuma-ulo-ikwū. 27 Otù okorọbia we b͕a ọsọ, gosi Moses, si, Eldad na Midad nēbu amuma n'ọmuma-ulo-ikwū. 28 Joshua nwa Nun, onye nējere Moses ozi, bú otù onye nime ndikom-ya arọputaworo, we za, si, Onye-nwem Moses, b͕ochie ha. 29 Moses we si ya, Ọ̀ bu onye nēkwo ekworo ka i burum? ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ndi Jehova nile bu ndi-amuma ka Jehova we tiyekwasi ha Mọ-Ya! 30 Moses, ya na ndi-okenye Israel, we chikọta onwe-ha n'ọmuma-ulo-ikwū. 31 Otù ifufe we si n'ebe Jehova nọ bulie ije, we keputa nnunu quail n'oké osimiri, rapu ha n'akuku ọmuma-ulo-ikwū, dika ije otù ubọchi n'otù akuku, na dika ije otù ubọchi n'akuku. nke-ọzọ, buruburu ọmuma-ulo-ikwū, na dika cubit abua n'elu iru ala. 32 Ndi Israel we bilie ubọchi ahu nile, na abali-ya nile, na echi-ya nile, chikọta nnunu quail ahu: onye nāchikọta ntà chikọtara homer iri: ha we were ha b͕asara onwe-ha n'ebe nile buruburu-ọmuma-ulo-ikwū 33 Mb͕e anu ahu nādi n'etiti ezé-ha ub͕u a, tutu atabie ya, iwe Jehova we di ọku megide ndi Israel, Jehova we were ihe-otiti riri nne nke-uku tie ndi Israel. 34 Ewe kpọ aha ebe ahu Kibrot-hataava: n'ihi na n'ebe ahu ka ha lìri ndi Israel ndi nāchọ ajọ ọchichọ. 35 Ndi Israel siri na Kibrot-hataava bulie ije rue Hazerot; ha we nọ na Hazerot.

Ọnu-Ọgugu 12

1 Miriam na Eron we kwue okwu megide Moses n'ihi nwayi Etiopia ahu ọ lutara: n'ihi na nwayi Etiopia ka ọ lutara. 2 Ha we si, Ọ̀ bu ezie na nání Moses ka Jehova wereworo kwue okwu? Ọ̀ bughi kwa ayi ka o wereworo kwue okwu? Jehova we nu ya. 3 Ma nwoke ahu, bú Moses, di ume-ala n'obi nke-uku, kari madu nile ndi nọ n'elu ala. 4 Jehova we si Moses na Eron na Miriam na mberede, Putanu, unu atọ, rue ulo-ikwū nzute. Ha atọ we puta. 5 Jehova we ridata n'ogidi igwe-oji, guzo n'ọnu-uzọ Ulo-ikwū, kpọ Eron na Miriam: ha abua we puta. 6 Ọ we si Biko, nurunu okwum nile: ọ buru na onye-amuma di n'etiti unù, n'ọhu ka Mu, bú Jehova, gēme ka ọ maram, na nrọ ka M'gāgwa ya okwu. 7 Ọ bughi otú a ka orùm Moses di; n'ulom nile onye kwesiri ntukwasi-obi ka ọ bu 8 ọnu na ọnu ka M'gāgwa ya okwu ọbuná n'ile-anya, ọ bughi kwa n'ilu di iche iche; udi Jehova ka ọ gēlegide kwa anya: ọ̀ bu kwa gini mere unu nātughi egwu ikwu okwu megide orùm, bú imegide Moses? 9 Iwe Jehova we di ọku megide ha; Ọ we la. 10 Igwe-oji ahu we si n'elu Ulo-ikwū ahu wezuga onwe-ya; ma, le, Miriam bu onye ekpenta, dika snow; Eron we che Miriam iru, ma, le, ọ bu onye-ekpenta. 11 Eron we si Moses, Biko, onye-nwem, ariọm i, atukwasila ayi nmehie, nke ayi buru ndi-nzuzu nime ya, nke ayi mehiewo-kwa-ra nime ya. 12 Biko, ka ọ ghara idi ka onye nwuru anwu, nke nkera anu-aru-ya richapuworo mb͕e o si n'àkpà-nwa nne-ya puta. 13 Moses we tikue Jehova, si, Chineke, biko, me ka aru-ya di ike, biko. 14 Jehova we si Moses, Ọ buru na nna-ya ab͕asa ya asọ n'iru ma-ọli, ìhere agaghi-eme ya ubọchi asa? ka emechibido ya uzọ n'azu ọmuma-ulo-ikwū ubọchi asa, emesia agāchikọta kwa ya na ndi Israel. 15 Ewe mechibido Miriam uzọ n'azu ọmuma-ulo-ikwū ubọchi asa: ma ndi Israel ebulighi ije rue mb͕e achikọtara Miriam na ndi Israel. 16 Ma emesia ndi Israel siri na Hazerot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ọzara Peran.

Ọnu-Ọgugu 13

1 Jehova we gwa Moses okwu, si, 2 Zigara onwe-gi ndikom, ka ha we ledo ala Kenean, nke Mu onwem nēnye umu Israel: otù nwoke otù nwoke diri ebo nna-ya-hà ka unu gēziga, onye ọ bula, ọ buru onye-isi n'etiti ha. 3 Moses we si n'ọzara Peran ziga ha n'okwu-ọnu Jehova: ha nile bu ndikom, ndi-isi umu Israel ka ha bu. 4 Ndia bu aha-ha: nke diri ebo Reuben bu Shamua nwa Zakua. 5 Nke diri ebo Simeon bu Shefat nwa Hori. 6 Nke diri ebo Juda bu Keleb nwa Jefune. 7 Nke diri ebo Isaka bu Igal nwa Josef. 8 Nke diri ebo Efraim bu Hoshia nwa Nun. 9 Nke diri ebo Benjamin bu Palti nwa Rafu. 10 Nke diri ebo Zebulun bu Gadiel nwa Sodi. 11 Nke diri ebo Josef, nke ahu bu, nke diri ebo Manase, bu Gadi nwa Susi. 12 Nke diri ebo Dan bu Amiel nwa Gemali. 13 Nke diri ebo Asha bu Setua nwa Maikael. 14 Nke diri ebo Naftali bu Nahbi nwa Vọfsi. 15 Nke diri ebo Gad bu Geuel nwa Maki. 16 Ndia bu aha ndikom ahu nke Moses zigara iledo ala ahu. Moses we kpọ Hoshia nwa Nun Joshua. 17 Moses we ziga ha iledo ala Kenean, ọ si ha, Rigonu n'uzọ a nime Negeb, rigo-kwa-nu n'ugwu: 18 we hu ala ahu, ihe ọ bu; na ndi ahu ndi bi na ya, ma ọ bu ndi di ike ka ha bu, ma-ọbu ndi nādighi ike, ma ọ bu madu ole-na-ole ka ha di, ma-ọbu ọtutu madu; 19 na ihe ala ahu bu nke ndi ahu nēbi nime ya, ma ọ bu ezi ala ka ọ bu ma-ọbu ala ọjọ; na ihe obodo nile bu nke ndi ahu nēbi nime ha, ma ọ bu na ha bi n'ọmuma-ulo-ikwū, ma-ọbu n'ebe ewusiri ike; 20 na ihe ala ahu bu, ma ọ bu ala nwere ume ka ọ bu ma-ọbu ala nātà ihe, ma osisi di nime ya, ma-ọbu na ọ dighi. Me kwa onwe-unu ka unu di ike, weta kwa ufọdu nime nkpuru ala ahu. Ma mb͕e ahu bu mb͕e nke nkpuru mbu nke nkpuru-vine. 21 Ha we rigo, ledo ala ahu site n'ọzara Zin rue Rehob, na nbata Hemat. 22 Ha we rigo nime Negeb, biarue Hebron; ma n'ebe ahu ka Ahiman na Sheshai na Talmai, bú umu Anak, nọ (Ma ewuru Hebron arọ asa tutu ewue Zoan n'Ijipt. ) 23 Ha we biarue ndagwurugwu Eshkol, si n'ebe ahu b͕utu otù alaka na otù uyọkọ nkpuru-vine; ha we būru ya n'osisi eji ebu ihe n'etiti madu abua; ha weta-kwa-ra ufọdu nime nkpuru pomegranate na ufọdu nime nkpuru fig. 24 Akpọrọ ebe ahu ndagwurugwu Eshkol, n'ihi uyọkọ nke umu Israel si n'ebe ahu b͕utu. 25 Ha we si n'iledo ala ahu lata n'ọgwugwu ọgu ubọchi abua. 26 Ha we je biakute Moses, biakute kwa Eron, biakute kwa nzukọ nile nke umu Israel, rue ọzara Peran, rue Kedesh; we weghachiri ha na nzukọ Israel nile okwu, me kwa ka ha hu nkpuru ala ahu. 27 Ha we kọrọ ya akukọ, si Ayi bara n'ala ahu ebe i zigara ayi, ọzọ kwa, ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya ka ọ bu; nka bu kwa nkpuru-ya. 28 Otú ọ di, ndi bi n'ala ahu di ike, ewusi-kwa-ra obodo nile ha ike, ha di kwa uku ri nne: ọzọ kwa, umu Anak ka ayi huru n'ebe ahu. 29 Amalek bi n'ala Negeb; ndi Het na ndi Jebus na ndi-Amorait bi n'ugwu: ndi Kenean bi n'usọ oké osimiri, na n'akuku Jọdan. 30 Keleb we me ka ndi Israel b͕a nkiti n'ebe Moses nọ, ọ si, Ka ayi rigo nọ, nweta ya; n'ihi na ayi puru ime ya nke-ọma. 31 Ma ndikom ahu ndi soro ya rigo siri, Ayi apughi irigo imegide ndi ahu, n'ihi na ndi di ike ka ha bu kari ayi. 32 Ha we me ka akukọ ọjọ putara umu Israel bayere ala ahu nke ha ledoro, si, Ala ahu, nke ayi gabigaworo nime ya iledo ya, ala nke nēripia ndi bi ya ka ọ bu; ọzọ ndi nile ayi huru n'etiti ya bú ndikom toro ogologo. 33 N'ebe ahu ka ayi hu-kwa-ra ndi-Nefilim, bú umu Anak, ndi sitere na ndi-Nefilim: ayi we di n'anya onwe-ayi dika ogugu, ọ bu kwa otú a ka ayi di n'anya-ha.

Ọnu-Ọgugu 14

1 Nzukọ Israel nile we welie olu-ha, tie nkpu; ndi Israel we kwa ákwá abali ahu. 2 Umu Israel nile we tamue ntamu megide Moses, megide kwa Eron: nzukọ ahu nile we si ha, Ọ gādi ayi nọ nma ma asi na ayi anwuruwo n'ala Ijipt, ma-ọbu n'ọzara nka! ọ gādi ayi nọ nma ma asi na ayi anwuruwo! 3 Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka Jehova nēme ka ayi ba n'ala nka, ida site na mma-agha? Ndinyom-ayi na umu-ntakiri-ayi gāghọ ihe-nluta-n'agha: ọ̀ gaghi-adi ayi nma ilaghachi n'Ijipt? 4 Ha we sirita onwe-ha, Ka ayi me otù onye onye-isi, ka ayi laghachi kwa n'Ijipt. 5 Moses na Eron we da kpue iru-ha n'ala n'iru nkpọkọta nile nke nzukọ umu Israel. 6 Joshua nwa Nun na Keleb nwa Jefune, bú ndi sitere na ndi nēledo ala ahu, we dọwa uwe-ha: 7 ha we gwa nzukọ nile nke umu Israel okwu, si, Ala ahu nke ayi gabigaworo nime ya iledo ya, ala ahu di nma nke-uku nke-uku. 8 Ọ buru na ihe ayi atọ Jehova utọ, Ọ gēme kwa ka ayi ba n'ala nka, Ọ gēnye kwa ayi ya; bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya. 9 Nání, unu enupukwala isi n'aka Jehova, unu onwe-unu atu-kwa-la egwu ndi ala ahu; n'ihi na nri-ayi ka ha bu: ihe-nchegide-ha ewezugawo onwe-ya n'aru ha, ma Jehova nọyere ayi: unu atula egwu ha. 10 Nzukọ Israel nile we si ka ewere nkume tub͕ue ha. Ewe me ka umu Israel nile hu ebube Jehova anya n'ulo-ikwū nzute. 11 Jehova we si Moses, Rùe ole mb͕e ka ndi nka gēlelìm anya? ọ̀ bu kwa rue ole mb͕e ka ha nāgaghi-ekwe na Mu, n'ihi ihe-iriba-ama nile nke M'meworo n'etiti ha? 12 M'gēwere ajọ ọria nēfe efe tib͕ue ha, M'gānapu kwa ha ihe ha nwere, M'gēme kwa gi ka i ghọ mba di uku di kwa ike kari ha. 13 Moses we si Jehova, Ndi Ijipt gānu kwa ya; n'ihi na I were ike-Gi me ka ndi nka si n'etiti ha rigoputa; 14 ha gāgwa kwa ndi bi n'ala nka okwu a: ha anuwo na Gi onwe-gi, Jehova, nọ n'etiti ndi nka; n'ihi na anya na anya ka ahuworo Gi onwe-gi, Jehova, igwe-oji-Gi nēguzo kwa n'elu ha, ọ bu kwa n'ogidi igwe-oji ka Gi onwe-gi nēje ije n'iru ha n'ehihie, na n'ogidi ọku n'abali. 15 Ma asi na I me ka ndi nka nwua dika otù onye, mba nile ndi nuworo akukọ bayere Gi gēkwu kwa, si, 16 N'ihi na Jehova apughi ime ka ndi nka ba n'ala ahu nke Ọ ṅuru ha iyi inye ha, n'ihi ya ka O b͕uworo ha n'ọzara. 17 Ma ub͕u a, biko, ka ike Onye-nwe-ayi di uku, dika I kwuworo, si, 18 Jehova adighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ nāba uba n'ebere, Ọ nāb͕aghara kwa ajọ omume na njehie, ma ọ dighi uzọ ọ bula Ọ gāgu ndi ikpe mara na ha bu ndi ikpe nāmaghi; Ọ nēwere kwa ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ. 19 Biko, b͕aghara ajọ omume nke ndi nka dika idi-uku nke ebere-Gi si di, na dika I b͕agharaworo ndi nka, site n'Ijipt we rue ub͕u a. 20 Jehova we si, Ab͕agharawom dika okwu-gi si di: 21 ma otù ọ di, Mu onwem nādi ndu, uwa nile gējuputa kwa n'ebube Jehova; 22 n'ihi na ndikom ahu nile ndi huworo ebubem, na ihe-iriba-amam nile, nke M'meworo n'Ijipt na n'ọzara, ma ha nwaworom ub͕ò iri a, ha egeghi kwa olum nti; 23 ha agaghi-ahu ala ahu ma-ọli nke M'ṅuru ndi bu nna-ha iyi inye ha, ndi nile nke nēlelìm anya agaghi-ahu kwa ya: 24 ma orùm Keleb, n'ihi na mọ di iche nọ n'ime ya, n'ihi kwa na o nēsozum n'azu, M'gēme kwa ka ọ ba n'ala ahu ebe ọ bara; nkpuru-ya gēnweta kwa ya. 25 Ma ndi Amalek na ndi Kenean bi na ndagwurugwu a: echi chigharianu, buli-kwa-ra onwe-unu ije je n'ọzara n'uzọ Oké Osimiri Uhie. 26 Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si, 27 Rùe ole mb͕e ka M'gānagide nzukọ ọjọ nka nke nātamu ntamu megidem? ntamu nile nke umu Israel, nke ha onwe-ha nātamu megidem, ka M'nuworo. 28 Si ha, Mu onwem nādi ndu, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, dika unu kwuworo na ntim, otú a ka M'nāghaghi ime unu: 29 n'ọzara nka ka ozu-unu ga-ada; ndi-unu nile agukọtara agukọta, dika ọnu-ogugu nile unu si di, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, ndi tamuworo ntamu megidem, 30 unu onwe-unu agaghi-abà n'ala ahu ma-ọli, nke M'buliri akam ime ka unu biri nime ya, ma-ọbughi Keleb nwa Jefune na Joshua nwa Nun. 31 Ma umu-ntakiri-unu, ndi unu siri na ha gāghọ ihe-nluta-n'agha, M'gēme kwa ka ha ba, ha gāma kwa ala ahu nke unu juru aju. 32 Ma unu onwe-unu, ozu-unu gāda n'ọzara nka. 33 Umu-unu gābu kwa ndi-ọzùzù-aturu n'ọzara ọgu arọ abua, ha gēbu kwa ọkwukwa-iko nile unu, rue mb͕e ozu-unu gāgwusi n'ọzara. 34 Dika ọnu-ọgugu ubọchi nke unu ji ledo ala ahu anya si di, bú ọgu ubọchi abua, otù ubọchi otù arọ, otù ubochi otù arọ, otù a ka unu gēbu ajọ omume nile unu, ọgu arọ abua, unu gāma kwa iju-ajum. 35 Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo, nka ka M'nāghaghi imere nzukọ ọjọ a nile, ndi nēzukọ imegidem: n'ọzara nka ka ha gāgwusi, ọ bu kwa n'ebe ahu ka ha gānwu. 36 Ma ndikom ahu, ndi Moses zigara iledo ala ahu, ndi lata-kwa-ra, me ka nzukọ Israel nile tamu ntamu megide Ya, n'ime ka akukọ ọjọ bayere ala ahu puta, 37 ọbuná ndikom ahu, bú ndi nēme ka akukọ ọjọ bayere ala ahu puta, nwuru n'ihe-otiti ahu n'iru Jehova. 38 Ma Joshua nwa Nun na Keleb nwa Jefune di ndu site na ndikom ahu ndi jeworo iledo ala ahu. 39 Moses we gwa umu Israel nile okwu ndia: ndi Israel we rue újú nke-uku. 40 Ha we bilie n'isi-ututu, rigorue elu ugwu ahu, si, Le ayi, Le ayi, ayi gārigoru kwa ebe ahu nke Jehova kwuru okwu bayere ya: n'ihi na ayi emehiewo. 41 Moses we si, N'ìhi gini kwa ka unu onwe-unu nāgabiga okwu-ọnu Jehova? ma nke ahu agaghi-aga nke-ọma. 42 Unu arigola, n'ihi na Jehova anọghi n'etiti unu; ka ewe ghara itib͕u unu n'iru ndi-iro-unu. 43 N'ihi na ndi Amalek na ndi Kenean nọ n'ebe ahu n'iru unu, unu gāda kwa site na mma-agha: n'ihi na unu esiwo n'iso Jehova laghachi, n'ihi ya Jehova agaghi-anọyere unu. 44 Ma ha were npako rigorue elu ugwu ahu: ma ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, na Moses, esighi n'etiti ọmuma-ulo-ikwū pua. 45 Ndi Amalek we ridata, ha na ndi Kenean, bú ndi bi n'ugwu ahu, ha we tib͕ue ha, tipia kwa ha rue Họma.

Ọnu-Ọgugu 15

1 Jehova we gwa Moses okwu, si, 2 Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e unu gābà n'ala ebe-obibi nile unu, nke Mu onwem nēnye unu, 3 mb͕e unu gēme kwa àjà-ọku ichuru Jehova, bú àjà-nsure-ọku, ma-ọbu àjà ọzọ, imezu nkwa, ma-ọbu n'onyinye-afọ-ofufo, ma-ọbu na mb͕e nile unu akara àkà, ime ihe ísì utọ isurere Jehova, sitere n'ìgwè ehi, ma-ọbu n'ìgwè ewu na aturu: 4 onye ahu nke nēweta nso onyinye-ya iji biaru nso gēweta kwa nso Jehova onyinye-inata-iru-ọma, bú otù uzọ n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour agwara n'otù uzọ n'uzọ anọ nke otù hin nke manu: 5 manya-vine iji chu àjà-ihe-ọṅuṅu, otù uzọ n'uzọ anọ nke hin, tiyere àjà-nsure-ọku ahu, ma-ọbu iji chu àjà ọzọ ahu, ka i gēdoziri otù nwa-aturu. 6 Ma-ọbu n'ichu ebulu n'àjà, i gēdozi onyinye-inata-iru-ọma, uzọ abua n'uzọ iri nke otù ephah utu ọku flour agwara n'otù uzọ n'uzọ atọ nke otù hin nke manu. 7 Manya-vine iji chu àjà-ihe-ọṅuṅu, otù uzọ n'uzọ atọ nke otù hin, ka i gēweta kwa nso, ka ọ buru ihe ísì utọ isurere Jehova. 8 Ọzọ, mb͕e i nēme nwa-oke-ehi ka ọ buru àjà-nsure-ọku, ma-ọbu àjà ọzọ, imezu nkwa, ma-ọbu ichu àjà-udo anāchuru Jehova: 9 ọ gēweta kwa nso, tiyere nwa-oke-ehi ahu, onyinye-inata-iru-ọma, bú uzọ atọ n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour agwara na nkera hin nke manu. 10 Manya-vine ka i gēweta kwa nso iji chu àjà-ihe-ọṅuṅu, nkera hin, ka ọ buru àjà-ọku nke ihe ísì utọ isurere Jehova. 11 Otú a ka agēmere otù oke-ehi, ma-ọbu otù ebulu, ma-ọbu otù nwa nime aturu ma-ọbu nime ewu. 12 Dika ọnu-ọgugu ihe nke unu nēdozi si di, otú a ka unu gēmere ihe ọ bula dika ọnu-ọgugu-ha si di. 13 Onye ọ bula amuru n'ala gēme ihe ndia otú a, n'iweta nso àjà-ọku nke ihe ísì utọ isurere Jehova. 14 ọzọ mb͕e ọbìa nọ n'ala-unu dika ọbìa, ma-ọbu onye ọ bula nọ n'etiti unu rue ọb͕ọ nile unu, mb͕e ọ gēme àjà-ọku nke ihe ísì utọ anēsurere Jehova; dika unu si eme, otú a ka ọ gēme. 15 Nime nkpọkọta nka, otù ukpuru diri unu, di-kwa-ra ọbìa nke nọ dika ọbìa, bú ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ nile unu: dika unu si di, otú a ka ọbìa ahu gādi n'iru Jehova. 16 Otù iwu na otù ikpé gādiri unu, di-kwa-ra ọbìa nke nọ dika ọbìa n'ala-unu. 17 Jehova we gwa Moses okwu, si, 18 Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e unu gābà n'ala ahu ebe Mu onwem nēme ka unu ba, 19 ọ gēru kwa, mgbe unu nēri nime nri ala ahu, na unu gēbuliri Jehova àjà-nbuli. 20 Ob͕e achicha nke utu ọka mbu unu ka unu gēbuli, ka ọ buru àjà-nbuli: dika àjà-nbuli nke ebe-nzọcha-ọka, otú a ka unu gēbuli ya. 21 Site n'utu ọka mbu unu unu gēnye Jehova àjà-nbuli rue ọb͕ọ nile unu. 22 Ọzọ, mb͕e unu gēme ihe n'amaghi-ama, ghara kwa ime ihe ndia nile enyere n'iwu, nke Jehova gwaworo Moses, 23 bú ihe nile nke Jehova nyere unu n'iwu n'aka Moses, site n'ubọchi nke Jehova nyere iwu, we gaba n'iru rue ọb͕ọ nile unu; 24 ọ gēru kwa, ma ọ buru na emewo ya n'amaghi-ama, n'ebe anya nzukọ Israel nērughi, na nzukọ ahu nile gēme otù nwa-oke-ehi ka ọ buru àjà-nsure-ọku, ibu ihe ísì utọ anēsurere Jehova, ya na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-Ihe-ọṅuṅu-ya, dika ikpé-ya si di, na otù nkpi iji chu àjà-nmehie. 25 Onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra nzukọ nile nke umu Israel nmehie-ha, agāb͕aghara kwa ha; n'ihi na amaghi-ama ka ọ bu, ha onwe-ha ewetawo kwa nso onyinye-ha iji biaru nso, bú àjà-ọku ichuru Jehova, na àjà-nmehie-ha n'iru, Jehova, n'ihi amaghi-ama-ha: 26 agāb͕aghara kwa nzukọ nile nke umu Israel, ha na ọbìa nke nọ dika ọbìa n'etiti ha; n'ihi na n'ebe ndi Israel nile nọ emere ya n'amaghi-ama. 27 Ma ọ buru na otù onye emehie n'amaghi-ama, ọ gēweta kwa nso nne-ewu nke b͕ara otù arọ iji chu àjà-nmehie. 28 Onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra nkpuru-obi ahu nmehie-ya, bú nke nēme ihe n'amaghi-ama, mb͕e ọ nēmehie n'amaghi-ama, n'iru Jehova, ikpuchiri ya nmehie-ya; agāb͕aghara kwa ya. 29 Ma onye amuru n'ala n'etiti umu Israel, ma ọbìa nke nọ dika ọbìa n'etiti ha, otù iwu ka unu gēnwe bayere onye nēme ihe n'amaghi-ama. 30 Ma nkpuru-obi ahu nke nēwere aka npako me ihe, ma ọ bu onye amuru n'ala ma-ọbu ọbìa, Jehova ka onye ahu nēkwulu; agēbipu kwa nkpuru-obi ahu n'etiti ndi-ya. 31 N'ihi na ọ bu okwu Jehova ka ọ lelíworo anya, n'ihi kwa na ọ bu ihe O nyere n'iwu ka o mebiworo; agēbipu nkpuru-obi ahu ebipu, ajọ omume-ya gādikwasi ya. 32 Umu Israel we nọ n'ọzara, ha we huta otù nwoke ka ọ nāchikọta nkú n'ubọchi-izu-ike. 33 Ndi hutara ya ka ọ nāchikọta nkú we me ka ọ biakute Moses na Eron na nzukọ Israel nile. 34 Ha we me ka ọ nọdu n'ebe anēdebe ndi-nkpọrọ, n'ihi na agwaghi ha ihe banyere ya, bú ihe agēme ya. 35 Jehova we si Moses, Aghaghi ime ka nwoke ahu nwua: nzukọ Israel nile gēwere nkume tub͕ue ya n'azu ọmuma-ulo-ikwū. 36 Nzukọ ahu nile we me ka ọ pua je n'azu ọmuma-ulo-ikwū, ha we were nkume tub͕ue ya, ọ we nwua; dika Jehova nyere Moses iwu. 37 Jehova we gwa Moses okwu, si, 38 Gwa umu Israel okwu, si ha mere onwe-ha ọnu-ọnu n'elu usọ uwe-ha rue ọb͕ọ nile ha, tiyekwasi kwa n'ọnu-ọnu nke usọ uwe ahu eriri-nma ogho anunu: 39 ọ gābu-kwa-ra unu ọnu-ọnu usọ uwe, ka unu we hu ya anya, we cheta ihe nile Jehova nyere n'iwu, me kwa ha; ka unu we ghara kwa iledo otú unu gēso obi-unu, otú unu gēso kwa anya-unu, nke unu onwe-unu nēso ha ikwa iko: 40 ka unu we cheta me kwa ihe nile M'nyere n'iwu, buru kwa ndi diri Chineke-unu nsọ. 41 Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Nke mere ka unu si n'ala Ijipt puta, ka M'we buru unu Chineke: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

Ọnu-Ọgugu 16

1 Ma Kora, nwa Izha, nwa Kohat, nwa Livai, ya na Detan na Abairam, umu Eliab, na On, nwa Pelet, bú umu Reuben, chiri ndikom: 2 ha we bilie n'iru Moses, ha na ndikom ufọdu ndi sitere n'umu Israel, ọgu ndi isi nzukọ iri-na-abua na iri, ndi akpọrọ ibia na nzute, ndikom amara aha-ha: 3 ha we kpọkọta onwe-ha imegide Moses na imegide Eron, si ha, O zuworo unu, n'ihi na nzukọ Israel nile, ha nile n'otù n'otù, di nsọ, ọ bu kwa n'etiti ha ka Jehova nọ: ọ̀ bu kwa gini mere unu nēbuli onwe-unu kari nkpọkọta nke Jehova? 4 Moses we nu ya, we da kpue iru-ya n'ala: 5 o we gwa Kora, gwa kwa nzukọ-ya nile, okwu, si, N'ututu Jehova gēme ka amara ndi O nwere, na onye di nsọ, na onye Ọ gēme ka ọ biarue nso Ya: Onye Ọ gārọputa, onye ahu ka Ọ gēme kwa ka ọ biarue nso Ya. 6 Menu nka; chirinu n'onwe-unu ihe-igu-ọku, Kora, na nzukọ-ya nile; 7 tiye-kwa-nu ọku nime ha, tukwasi kwa n'elu ha ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'iru Jehova echi: ọ gēru kwa na nwoke ahu nke Jehova gārọputa, onye ahu bu onye nsọ: o zuworo unu, umu Livai. 8 Moses we si Kora, Biko, nurunu, umu Livai: 9 Ọ̀ bu unu ihe ntà na Chineke nke Israel akpawo ókè n'etiti unu na nzukọ Israel, ime ka unu biarue nso Ya; ifè òfùfè nke ebe-obibi Jehova, na iguzo n'iru nzukọ ahu ijere ha ozi; 10 Ọ we me ka i biarue nso, gi na umu-nne-gi niile, bú umu Livai? ùnu nācho kwa ọlu nchu-àjà? 11 N'ihi ya gi onwe-gi na nzukọ-gi nile bu ndi nēzukọ imegide Jehova: ma Eron, gini ka ọ bu na unu nātamu ntamu megide ya? 12 Moses we ziga ikpọ Detan na Abairam, bú umu Eliab: ha we si, Ayi agaghi-arigo: 13 ọ̀ bu ihe ntà na i mewo ka ayi si n'ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya rigoputa, ime ka ayi nwua n'ọzara nka, ma i ghaghi ime kwa onwe-gi onye-isi-ayi? 14 Ọzọ kwa, ọ bughi ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nēru nime ya ka i meworo ka ayi ba, i nyeghi kwa ayi ihe-nketa, bú ubi na ubi-vine: ì gārukpọ anya ndikom ndia? ayi agaghi-arigo. 15 Moses we we iwe di ọku nke-uku, ọ we si Jehova, Echela onyinye-inata-iru-ọma-ha iru: ọ dighi otù inyinya-ibu m'naraworo n'aka-ha, ọ dighi kwa otù onye nime ha M'mejọworo. 16 Moses we si Kora, Gi onwe-gi na nzukọ-gi nile nọ n'iru Jehova, gi, na ha, na Eron, echi: 17 chiri-kwa-nu, nwoke ọ bula ihe-igu-ọku-ya, tiye kwa ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'elu ha, weta kwa-nu ha nso n'iru Jehova, nwoke ọ bula ihe-igu-ọku-ya, ọgu ihe-igu-ọku iri-na-abua na iri; gi onwe-gi kwa, na Eron, nwoke ọ bula ihe-igu-ọku-ya. 18 Ha we chiri, nwoke ọ bula ihe-igu-ọku-ya, tiye ọku n'elu ha, tukwasi kwa ha ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, we guzo n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, ha na Moses na Eron. 19 Kora we kpọkọta nzukọ Israel nile megide ha rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute: ewe me ka nzukọ ahu nile hu ebube Jehova anya. 20 Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si, 21 Kewapunu onwe-unu n'etiti nzukọ nka, ka M'we me ka ha gwusia dika n'otù ntabi-anya. 22 Ha we da kpue iru-ha n'ala, si, Chineke, bú Chineke nke mọ nile na anu-aru nile, bú madu, nwere, asi na otú nwoke emehie, Ì gēwesa kwa nzukọ a nile iwe? 23 Jehova we gwa Moses okwu, si, 24 Gwa nzukọ Israel okwu, si, Sinu na buruburu ebe-obibi nke Kora na Detan na Abairam rigo. 25 Moses we bilie, jekuru Detan na Abairam; ndi-okenye Israel we so ya. 26 o we gwa nzukọ Israel okwu, si, Biko, sinu n'ulo-ikwū ndikom ndia, bú ndi nēmebi iwu, wezuga onwe-unu, unu emetu-kwa-la ihe ọ bula ha nwere, ka ewe ghara ikpochapu unu nime nmehie-ha nile. 27 Ha we si n'ebe-obibi nke Kora na Detan na Abairam buruburu rigo: Detan na Abairam we puta, guzo onwe-ha n'ọnu-uzọ ulo-ikwū-ha, ha na ndinyom-ha, na umu-ha ndikom, na umu-ntakiri-ha. 28 Moses we si, Na nka ka unu gāmara na Jehova ezitewom ime omume ndia nile; n'ihi na ha esiteghi n'obim. 29 Ọ buru na ọnwu dika ọnwu madu nile ka ndia gānwu, ọ buru kwa na ọ bu nleta madu nile ka aga eleta ha; Jehova eziteghm. 30 Ma ọ buru na ihe-òkìkè ọhu ka Jehova gēkè, ala ewe saghepu ọnu-ya, loda ha, ha na ihe nile ha nwere, ha we rida na ndu rue ala-mọ; unu gāmara kwa na ndikom ndia elelìwo Jehova. 31 O rue, mb͕e o kwubiri okwu ndia nile, na ala nke di n'okpuru ha b͕awara: 32 ala we saghe ọnu-ya, loda ha, na ulo nile ha, na madu nile Kora nwere, na àkù-ha nile. 33 Ha we rida na ndu rue ala-mọ, ha onwe-ha na ihe nile ha nwere: ala we mechie n'elu ha, ha we si n'etiti nkpọkọta ahu la n'iyì. 34 Israel nile ndi nọ ha buruburu we b͕alaga n'olu ákwá-ha: n'ihi na ha siri, Ka ala we ghara iloda ayi. 35 Ọku we si n'ebe Jehova nọ puta, ripia ọgu ndikom iri-na-abua na iri ahu nēweta nso ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ. 36 Jehova we gwa Moses okwu, si, 37 Gwa Eleeza nwa Eron, bú onye-nchu-àjà, ka o si n'etiti nsure-ọku ahu chilie ihe-igu-ọku ahu, gi kposa kwa ọku ahu n'akuku ahu; n'ihi na ha di nsọ; 38 bú ihe-igu-ọku nke ndi-nmehie ndia ndi megidere nkpuru-obi-ha, ka ewere kwa ha kpu mbadamba ihe ibu ihe-nmachita diri ebe-ichu-àjà: n'ihi na ha wetara ha nso n'iru Jehova, ha di kwa nsọ: ha gābu-kwa-ra umu Isael ihe-iriba-ama. 39 Eleeza, bú onye-nchu-àjà, we chiri ihe-igu-ọku ọla ahu, nke ndi ahu esurere ọku wetara nso, ha we tisa ha ka ha buru ihe-nmachita diri ebe-ichu-àjà: 40 iburu umu Israel ihe-ncheta, ka nwoke ala ọzọ onye nēsiteghi na nkpuru Eron, we ghara ibia nso isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'iru Jehova; ka ọ ghara idi ka Kora, di kwa ka nzukọ-ya: dika Jehova gwara ya okwu n'aka Moses. 41 Ma nzukọ nile nke umu Israel tamuru ntamu n'echi-ya megide Moses megide kwa Eron, si, Unu onwe-unu emewo ka ndi nke Jehova nwua. 42 O rue, mb͕e akpọkọtara nzukọ ahu megide Moses megide kwa Eron, na ha chere iru n'ulo-ikwū nzute: ma, le, igwe-oji ahu kpuchiri ya, ewe hu ebube Jehova. 43 Moses na Eron we bia n'iru ulo-ikwū nzute. 44 Jehova we gwa Moses okwu, si, 45 Sinu n'etiti nzukọ a bilie, ka M'we me ka ha gwusia dika n'otù ntabi-anya. Ha we da kpue iru-ha n'ala. 46 Moses we si Eron, Were ihe-igu-ọku-gi, tiye ọku n. elu-ya sitere n'elu ebe-ichu-àjà, tukwasi kwa ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, būru ya jekuru nzukọ Israel ngwa ngwa, kpuchiere ha nmehie-ha; n'ihi na iwe ahu esiwo n. iru Jehova puta; ihe-otiti ahu amalitewo. 47 Eron we were dika Moses kwuru, b͕abà n'etiti nkpọkọta ahu; ma, le, ihe-otiti ahu amalitewo n'etiti ndi Israel: ọ we tiye ihe-nsure-ọku ahu nēsì ísì utọ, we kpuchiere ndi ahu nmehie-ha. 48 Ọ we guzo n'etiti ndi nwuru anwu na ndi di ndu, ewe b͕ochie ihe-otiti ahu. 49 Ma ndi nwuru anwu n'ihe-otiti ahu di orú nnù na nnù iri-na-isi na ọgu iri-na-ise, nāgughi ndi nwuru anwu n'okwu Kora. 50 Eron we laghachikuru Moses rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute: ewe b͕ochie ihe-otiti ahu.

Ọnu-Ọgugu 17

1 Jehova we gwa Moses okwu, si, 2 Gwa umu Israel okwu, nara kwa n'aka-ha nkpa-n'aka nkpa-n'aka, otù diri otù ulo nna, n'aka ndi-isi ha nile, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, nkpa-n'aka iri-na-abua: aha nwoke ọ bula ka i gēdekwasi na nkpa-n'aka-ya 3 Ma aha Eron ka i gēdekwasi na nkpa-n: aka Livai: n'ihi na ọ bu otù nkpa-n'aka ka onye-isi ọ bula nke ulo nke ndi bu nna-ha gēnwe. 4 I gēdo kwa ha n'ulo-ikwū n'iru ihe-àmà ahu, ebe Mu na unu nēzute. 5 O gēru kwa, na nwoke ahu nke M'gārọputa, nkpa-n'aka-ya gāma ifuru: M'gēme kwa ka ntamu nile nke umu Israel si n'arum bìe, bú nke ha onwe-ha nātamu megide unu. 6 Moses we gwa umu Israel okwu, ndi-isi-ha nile we nye ya nkpa-n'aka, otù onye-isi otù nkpa-n'aka, otù onye-isi otù nkpa-n'aka, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di nkpa-n'aka iri na abua: nkpa-n'aka Eron di kwa n. etiti nkpa-n'aka-ha. 7 Moses we do nkpa-n'aka nile n'iru Jehova n'ulo-ikwū nke ihe-àmà. 8 O rue n'echi-ya, na Moses bara n'ulo-ikwū nke ihe-àmà; ma, le, nkpa-n'aka Eron nke diri ulo Livai amawo ifuru, b͕awa kwa ifuru ahu, wa kwa okoko, mì kwa almond chara acha. 9 Moses we si n'iru Jehova chiputara umu Israel nile nkpa-n'aka ahu nile: ha we le anya, were ha, nwoke ọ bula nkpa-n'aka-ya. 10 Jehova we si Moses, Doghachi nkpa-n'aka Eron n'iru ihe-àmàm ka ọ buru ihe-ndebe, iburu umu nnupu-isi ihe-iriba-ama; ka i we me ka ntamu nile ha si n'ebe M'nọ bìsia, ka ha we ghara inwu. 11 Moses we me ya: dika Jehova nyere ya iwu, otú a ka ọ mere. 12 Umu Israel we gwa Moses okwu, si, Le, ayi ekubìwo, ayi alawo n'iyì, ayi nile alawo n'iyì. 13 Onye ọ bula nke nābiaru nso, nke nābiaru nso ebe-obibi Jehova, gānwu: ọ̀ bu na ayi agwusiwo n'ikubì ekubì?

Ọnu-Ọgugu 18

1 Jehova we si Eron, Gi onwe-gi na umu-gi ndikom na ulo nna-gi tiyere gi gēbu ajọ omume nke ebe nsọm: gi onwe-gi na umu-gi ndikom tiyere gi gēbu kwa ajọ omume nke ọlu-nchu-àjà-unu. 2 Ọzọ kwa, umu-nne-gi, bú ebo Livai, ebo nna-gi, gi me ka ha soro gi biaru nso, ka ha we rapara n'aru-gi, nēje-kwa-ra gi ozi: ma gi onwe-gi na umu-gi ndikom tiyere gi gānọ n'iru ulo-ikwū ihe àmàm. 3 Ha gēdebe kwa ihe-ndebe-gi, na ihe-ndebe nke Ulo-ikwūm nile: nání na ha agaghi-abiaru nso ihe nile nke ebe nsọm, ha agaghi-abiaru kwa nso ebe-ichu-àjàm, ka ha we ghara inwu, ma ha, ma unu. 4 Ha gārapara kwa n'aru-gi, debe kwa ihe-ndebe nke ulo-ikwū nzute, nke diri òfùfè nile nke Ulo-ikwū ahu: ma onye ala ọzọ agaghi-abiaru nso unu. 5 Unu gēdebe kwa ihe-ndebe nke ebe nsọm, na ihe-ndebe nke ebe-ichu-àjàm: ka iwe we ghara idikwasi umu Israel ọzọ. 6 Ma Mu onwem, le, esiwom n'etiti umu Israel were umu-nne-gi, bú ndi Livai: ha buru onyinye, ndi enyere Jehova, ifè òfùfè nke ulo-ikwū nzute. 7 Ma gi onwe-gi na umu-gi ndikom tiyere gi gēdebe ọlu-nchu-àjà-unu bayere ihe nile nke ebe-ichu-àjàm, baye-kwa-ra ihe di nime ákwà-nb͕ochi; unu gēfè kwa: dika òfùfè nke onyinye ka M'nēnye unu ọlu-nchu-àjà-unu: ma onye ala ọzọ nke nābiaru nso, agēme ka ọ nwua. 8 Jehova we gwa Eron okwu, si, Ma Mu onwem, le, enyewom i ihe-ndebe nke àjà-nbulim nile, bú nke diri ihe nile edoro nsọ nke umu Israel, gi ka M'nyeworo ha ibu òkè otite-manu, nye kwa umu-gi ndikom, n'ukpuru ebighi-ebi. 9 Nka gābu nke gi site n'ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile, site n'ọku: onyinye-ha ọ bula iji biaru nso, ọbuná onyinye-inata-iru-ọma-ha ọ bula, na àjà-nmehie-ha ọ bula, na àjà-ikpe-ọmuma-ha ọ bula, nke ha gēnyeghachim, ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ gāburu gi, buru kwa umu-gi ndikom. 10 N'ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka i gēri ya: nwoke ọ bula gēri ya; ihe nsọ ka ọ gāburu gi. 11 Nka bu kwa nke gi, àjà-nbuli nke onyinye-ha, ọbuná-àjà-ofufé nile nke umu Israel: gi ka M'nyeworo ha, nye kwa umu-gi ndikom, nye kwa umu-gi ndinyom, tiyere gi, n'ukpuru ebighi-ebi onye ọ bula nke di ọcha n'ulo-gi gēri ya. 12 Manu nile nke kachasi nma nke manu ọhu, na manya nile nke kachasi nma nke manya-vine ọhu, na ọka, bú ihe mbu ha nke ha nēnye Jehova, gi ka M'nyeworo ha. 13 Nkpuru mbu nke ihe nile di n'ala-ha, nke ha nēwetara Jehova, nke gi ka ọ bu; onye ọ bula nke di ọcha n'ulo-gi gēri ya. 14 Ihe ọ bula ewezugara ka ebibie ya n'Israel, nke gi ka ọ bu. 15 Nwa ọ bula nke meghere àkpà-nwa, nke anu-aru nile nke ha nēweta nso Jehova, n'etiti madu na n'etiti anu-ulo, ọ bu nke gi: nání i ghaghi ib͕aputa nwa madu buru uzọ mu, nwa anu-ulo ruru árú buru uzọ mu ka i gāb͕aputa kwa. 16 Ma ndi-ha anāb͕aputa site na nke ruru otù ọnwa ka i gāb͕aputa, dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di, n'ọla-ọcha shekel ise, dika shekel nke ebe nsọm si di (orú gerah ka ọ bu). 17 Ma otú ọ di, nwa ehi buru uzọ mu, ma-ọbu nwa aturu buru uzọ mu, ma-ọbu nwa ewu buru uzọ mu, i gaghi-ab͕aputa ha; ihe nsọ ka ha bu: i gāwusa ọbara-ha n'ebe-ichu-àjàm, sure kwa abuba-ha ọku ibu ihe nsure-ọku nēsì ísì utọ, ka ọ buru àjà-ọku, ime ihe ísì utọ anēsurere Jehova. 18 Anu-ha bu kwa nke gi, dika okpukpu-obi nke àjà-ofufé, na dika utaku-ukwu aka-nri, nke gi ka ọ bu. 19 Àjà-nbuli nile nke ihe nsọ nile, nke umu Israel nēbuliri Jehova, ka M'nyeworo gi, nye kwa umu-gi ndikom, nye kwa umu-gi ndinyom, tiyere gi, n'ukpuru ebighi-ebi: ọb͕ub͕a-ndu nnú ebighi-ebi n'iru Jehova ka ọ buru gi, buru kwa nkpuru-gi tiyere gi. 20 Jehova we si Eron, I gaghi-eketa ihe n'ala-ha, ọ dighi kwa òkè i gēnwe n'etiti ha: Mu onwem bu òkè-gi na ihe-nketa-gi n'etti umu Israel. 21 Ma umu Livai, le, ha ka M'nyeworo otù uzọ n'uzọ iri nke ihe nile n'Israel, ibu ihe-nketa, dika ihe-nkwughachi òfùfè-ha, nke ha onwe-ha nēfè, bú òfùfè nke ulo-ikwū nzute. 22 Ma umu Israel agaghi-abiaru nso ulo-ikwū nzute ahu ọzọ ibū nmehie, inwu anwu. 23 Ma ndi Livai gēfè òfùfè ahu nke ulo-ikwū nzute, ha onwe-ha gēbu kwa ajọ omume-ha: ukpuru ebighi-ebi ka ọ bu rue ọb͕ọ nile unu, ma n'etiti umu Israel ha agaghi-eketa ihe-nketa. 24 N'ihi na ọ bu otù uzọ n'uzọ iri nke ihe umu Israel, nke ha nēbuliri Jehova dika àjà-nbuli, ka M'nyeworo ndi Livai, ibu ihe-nketa: ya mere M'siworo ha, N'etiti umu Israel ha agaghi-eketa ihe-nketa. 25 Jehova we gwa Moses okwu, si, 26 I gāgwa kwa ndi Livai okwu, si ha, Mb͕e unu nānara n'aka umu Israel otù uzọ n'uzọ iri nke M'nyeworo unu site n'aka-ha, dika ihe-nketa-unu, unu gēsi kwa na ya bulie àjà-nbuli nke Jehova, bú otù uzọ n'uzọ iri nke si n'otù uzọ n'uzọ iri ahu puta. 27 Agāgu-kwa-ra unu àjà-nbuli-unu, dika ọka nke si n'ebe-nzọcha-ọka puta, na dika ojuju-manya-vine nke si n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine puta. 28 Otú a ka unu gēbuli, ọbuná unu onwe-unu, àjà-nbuli nke Jehova sitere n'otù uzọ n'uzọ iri nke ihe unu nile, nke unu nānara n'aka umu Israel; unu gēsi kwa na ya nye Eron, bú onye-nchu-àjà, àjà-nbuli nke Jehova. 29 Unu gēsi n'onyinye-unu nile bulie àjà-nbuli ọ bula nke Jehova, site n'ihe-ya nile kachasi nma, bú ihe nsọ ya sitere na ya. 30 I gāsi kwa ha, Mb͕e unu nēsi na ya bulie ihe-ya kachasi nma, agāgu-kwa-ra ndi Livai ya dika ihe-ọmume nke ebe-nzọcha-ọka, na dika ihe-ọmume nke ebe-nzọcha-nkpuru-vine. 31 Unu gēri kwa ya n'ebe ọ bula, unu onwe-unu na ulo nile unu: n'ihi na ugwọ-ọlu ka ọ buru unu, bú ihe-nkwughachi òfùfè-unu n'ulo-ikwū nzute. 32 Unu agaghēbu kwa nmehie bayere ya, mb͕e unu si na ya bulie ihe-ya kachasi nma: unu agaghi-emeru kwa ihe nsọ nile nke umu Israel, unu agaghi-anwu kwa.

Ọnu-Ọgugu 19

1 Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si, 2 Nka bu ukpuru nke iwu ahu nke Jehova nyeworo n'iwu, si, Gwa umu Israel okwu, ka ha wetara gi nwa-ab͕ọghọ-ehi nācha uhie uhie nke zuru okè, nke ọlu nādighi n. aru-ya, nke ọ dighi mb͕e yoke rigokwasiri ya: 3 unu gēnye ya Eleeza, bú onye-nchu-àjà, ọ gēme ka ọ pua je n'azu ọmuma-ulo-ikwū, otù onye gēb͕u ya n'iru ya: 4 Eleeza, bú onye-nchu-àjà, gēwere ufọdu nime ọbara-ya na nkpisi-aka-ya, fesa ufọdu nime ọbara-ya na ncherita-iru ulo-ikwū nzute ub͕ò asa: 5 otù onye gēsure kwa nwa-ab͕ọghọ-ehi ahu ọku n'anya-ya; akpukpọ-ya, na anu-ya, na ọbara-ya, tiyere nsi-ya, ka o gēsure ọku: 6 onye-nchu-àjà gēwere kwa osisi cedar, na hyssop, na ogho uhie, tubà ya n'etiti nsure-ọku nwa-ab͕ọghọ-ehi ahu. 7 onye-nchu-àjà gāsu kwa uwe-ya, sa kwa anu-aru-ya na miri, emesia ọ gābata n'ọmuma-ulo-ikwū, onye-nchu-àjà gāru kwa árú rue anyasi. 8 Onye ahu nke nēsure ya ọku gāsu kwa uwe-ya na miri, sa kwa anu-aru-ya na miri, ọ gāru kwa árú rue anyasi. 9 Nwoke nke di ọcha gāchikọta ntu nke nwa-ab͕ọghọ-ehi ahu, do ya n'azu ọmuma-ulo-ikwū n'ebe di ọcha, ọ gābu-kwa-ra umu Israel ihe-ndebe ibu miri nke idi-na-nsọ: àjà-nmehie ka ọ bu. 10 Onye ahu nke nāchikọta ntu nwa-ab͕ọghọ-ehi gāsu kwa uwe-ya, ru kwa árú rue anyasi: ọ gābu-kwa-ra umu Israel, buru kwa ọbìa nke nọ dika ọbìa n'etiti ha, ukpuru ebighi-ebi. 11 Onye nēmetu ozu nwuru anwu nke madu ọ bula aru gāru árú ubọchi asa: 12 onye ahu gēwere ya wepu nmehie-ya n'ubọchi nke-atọ, n'ubọchi nke-asa ọ gādi kwa ọcha: ma ọ buru na o wepughi nmehie-ya n'ubọchi nke-atọ, ọ gaghi-adi kwa ọcha n'ubọchi nke-asa. 13 Onye ọ bula nke nēmetu onye nwuru anwu aru, bú ozu madu nke nwuru anwu, ma o wepughi nmehie-ya, ebe obibi Jehova ka ọ nēmeru; agēbipu kwa nkpuru-obi ahu n'Israel n'ihi na awusaghi ya miri nke idi-na-nsọ ahu, onye ruru árú ka ọ gābu; ọrurú-ya nādikwasi ya rue ub͕u a. 14 Nka bu iwu mb͕e madu nwuru n'ulo-ikwū: onye ọ bula nke nāba n. ulo-ikwū ahu, na onye ọ bula nke nọ n'ulo-ikwū ahu, gāru árú ubọchi asa. 15 Ihe ọ bula nke ghere oghe, nke nēnweghi ihe-nkpuchi eriri eji kechi elu-ya, ihe ruru árú ka ọ bu. 16 Onye ọ bula nke nēmetu onye eji mma-agha b͕u, ma-ọbu onye nwuru anwu, ma-ọbu ọkpukpu madu, ma-ọbu ílì, aru, n'ọhia sara iru, ọ gāru árú ubọchi asa. 17 Ha gēwere kwa ufọdu nime ntu nsure-ọku àjà-nmehie ahu bayere onye ahu ruru árú, agētiye kwa miri nērù erù n'elu ya nime ihe: 18 nwoke nke di ọcha gēwere kwa hyssop, sue ya na miri ahu, fesa ya n'ulo-ikwū ahu, na n'ihe-ya nile, na n'aru ndi nọ n'ebe ahu, na n'aru onye ahu nke metuworo ọkpukpu ahu, maọbu onye eb͕uru eb͕u ahu, ma-ọbu onye nwuru anwu ahu, maọbu ílì ahu, aru: 19 onye ahu nke di ọcha gēfesa kwa onye ahu ruru árú n'ubọchi nke-atọ, na n'ubọchi nke-asa: ọ gēwepu kwa nmehie-ya n'ubọchi nke-asa; ọ gāsu kwa uwe-ya, sa kwa aru-ya na miri, di ọcha n'anyasi. 20 Ma nwoke nke ruru árú, ma ọ dighi-ewepu nmehie-ya, agēbipu kwa nkpuru-obi ahu n'etiti nkpọkọta Israel, n'ihi na ọ bu nsọ Jehova ka ọ meruworo: awusaghi ya miri nke idi-na-nsọ ahu, onye ruru árú ka o bu. 21 Ọ gābu-kwa-ra ha ukpuru ebighi-ebi; onye nēfesa miri nke idi-na-nsọ ahu gāsu kwa uwe-ya; onye nēmetu miri nke idi-na-nsọ ahu aru gāru kwa árú rue anyasi. 22 Ihe ọ bula onye ruru árú nēmetu aru gāru árú; madu nke nēmetu ya aru gāru árú rue anyasi.

Ọnu-Ọgugu 20

1 Umu Israel, bú nzukọ ahu nile, we ba n'ọzara Zin n'ọnwa mbu: ndi Israel we nọdu na Kedesh; Miriam we nwua n'ebe ahu, ewe lìe ya n'ebe ahu. 2 Ma ọ dighi miri nzukọ ahu nwere: ha we kpọkọta onwe-ha megide Moses, megide kwa Eron. 3 Ndi Israel we so Moses se okwu, ha we kwue, si, Ọ gādi ayi nọ̄ nma ma asi na ayi ekubiwo mb͕e umu-nne-ayi kubiri n'iru Jehova! 4 Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka unu meworo nkpọkọta Jehova ka ọ ba n'ọzara nka, inwu n'ebe ahu, ayi onwe-ayi na anu-ulo-ayi? 5 Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka unu meworo ka ayi si n'Ijipt rigoputa, ime ayi ka ayi bata n'ebe ọjọ a? ọ bughi ebe nke nkpuru-ọghigha, ma-ọbu nke osisi fig, ma-ọbu nke osisi vine, ma-ọbu nke osisi pomegranate; ọ dighi kwa miri iṅu. 6 Moses na Eron we si n'iru nkpọkọta ahu biarute ọnu-uzọ ulo-Ikwū nzute, da kpue-iru-ha n'ala: ewe me ka ha hu ebube Jehova anya. 7 Jehova we gwa Moses okwu, si, 8 Were nkpa-n'aka ahu, kpọkọta kwa nzukọ Israel, gi onwe-gi, na Eron, bú nwa-nne-gi, unu gwa nkume ahu di elu okwu n'anya-ha, ka ọ we nye miri-ya; i gēme kwa ka miri si na nkume ahu di elu putara ha: i gēme kwa ka nzukọ ahu na anu-ulo-ha ṅua miri. 9 Moses we si n'iru Jehova were nkpa-n'aka ahu, dika O nyere ya iwu. 10 Moses na Eron we kpọkọta nkpọkọta Israel rue iru nkume ahu di elu, ọ si ha, Biko, nurunu, ndi nenupu isi, àyi gēme ka miri si na nkume a di elu putara unu? 11 Moses we welie aka-ya were nkpa-n'aka-ya tie nkume ahu di elu ub͕ò abua: miri riri nne we puta, nzukọ ahu we ṅua, ha na anu-ulo nile ha. 12 Jehova we si Moses na Eron, N'ihi na unu ekweghi na Mu, idom nsọ n'anya umu Israel, n'ihi ya unu agaghi-eme ka nkpọkọta nka ba n'ala ahu nke M'nyeworo ha. 13 Ndia bu miri Meriba; n'ihi na umu Israel soro Jehova se okwu, ewe do Ya nsọ nime ha. 14 Moses we si na Kedesh zigara eze Edom ndi-ozi, si, Otú a ka Israel, bú nwa-nne-gi, siri, Gi onwe-gi amawo ike-ọgwugwu nile nke gwuworo ayi: 15 na nna-ayi-hà ridara n'Ijipt, ayi we biri n'Ijipt ọtutu ubọchi; ndi Ijipt we mejo ayi, mejọ kwa nna-ayi-hà: 16 ayi we tikue Jehova, O we nu olu-ayi, zite mọ-ozi, me ka ayi si n'Ijipt puta: ma, le ayi onwe-ayi nọ na Kedesh, bú obodo nke di na nsọtu ókè-ala-gi: 17 biko, ka ayi gabiga nime ala-gi: ayi agaghi-agabiga nime ọhia ma-ọbu nime ubi-vine, ayi agaghi-aṅu kwa miri olùlù: n'uzọ eze ka ayi ganēje, ayi agaghi-ewezuga onwe-ayi n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe, rue mb͕e ayi gāgabiga ókè-ala-gi. 18 Edom we si ya, I gaghi-agabiga nimem, ka m'we ghara iwere mma-agha puta izute gi. 19 Umu Israel we si ya, Ọ bu n'uzọ atuliri atuli ka ayi gārigo: ọ buru kwa na ayi aṅua miri-gi, mu onwem na anu-ulom, m'gēnye kwa gi ọnu-ahia-ya: nání ka m'were ukwum gabiga, ọ dighi ọzọ. 20 O we si, I gaghi-agabiga. Edom we were ndi di uku aka di ike puta izute ya. 21 Edom we ju ikwe ka Israel gabiga n'ókè-ala-ya: Israel we si n'ebe ọ nọ wezuga onwe-ya. 22 Ha we si na Kedesh bulie ije: umu Israel, bú nzukọ ahu nile, we biarue ugwu Hoa. 23 Jehova we gwa Moses na Eron okwu n'ugwu Hoa, n'akuku ókè ala Edom si, 24 Agāchikọta Eron na umu-nna-ya n'ala-mọ' n'ihi na ọ gaghi-abà n'ala ahu nke M'nyeworo umu Israel, n'ihi na unu nupuru isi n'okwu-ọnum na miri Meriba. 25 Chiri Eron na Eleeza nwa-ya, me ka ha rigota n'ugwu Hoa: 26 i gēyipu Eron uwe-ya, yibe ha Eleeza nwa-ya: agāchikọta Eron na umu-nna-ya n'ala-mọ, ọ gānwu kwa n'ebe ahu. 27 Moses we me dika Jehova nyere ya iwu: ha we rigo n'ugwu Hoa n'anya nzukọ Israel nile. 28 Moses we yipu Eron uwe-ya, yibe ha Eleeza nwa-ya; Eron we nwua n'ebe ahu n'elu ugwu ahu: Moses na Eleeza we si n'ugwu ahu ridata. 29 Nzukọ Israel nile we hu na Eron ekubiwo, ha we kwara Eron ákwá orú ubọchi na iri, bú ulo Israel nile.

Ọnu-Ọgugu 21

1 Onye Kenean, bú eze Arad, onye bi na Negeb, we nu na Israel abiawo n'uzọ Atarim; ọ we buso Israel agha, dọta ufọdu nime ha n'agha. 2 Israel we kwere Jehova nkwa, si, Ọ buru na I nye ndi nka n'akam n'ezie, m'gēwezuga kwa obodo-ha nile ka ebibie ha. 3 Jehova we ge nti n'olu Israel, nye ndi Kenean n'aka-ha; ha we wezuga ha na obodo nile ha ka ebibie ha: ewe kpọ aha ebe ahu Họma. 4 Ha we si n'ugwu Hoa bulie ije ga n'uzọ Oké Osimiri Uhie, iga ala Edom buruburu: ma nkpuru-obi ndi Israel enweghi ntachi-obi n'uzọ ahu. 5 Ndi Israel we kwue okwu megide Chineke, megide kwa Moses, si, N'ìhi gini ka unu meworo ka ayi si n'Ijipt rigota inwu n'ọzara nka? n'ihi na achicha adighi, miri adighi kwa; ike agwusiwo kwa nkpuru-obi-ayi n'achicha nka di nfé. 6 Jehova we zite agwọ ahu nke yiri ọku n'etiti ndi Israel, ha we ta ndi Israel aru; ndi riri nne nwupuru n'Israel. 7 Ndi Israel we biakute Moses, si, Ayi emehiewo, n'ihi na ayi ekwuwo okwu megide Jehova, megide kwa gi; gi kpere Jehova, ka Ọ we wezuga agwọ ndia n'aru ayi. Moses we kpe ekpere n'ihi ndi Israel. 8 Jehova we si Moses, Mere onwe-gi agwọ yiri ọku, tukwasi ya n'ọkọlọtọ: o gēru kwa, na onye ọ bula ataworo gādi ndu, mb͕e ọ huworo ya anya. 9 Moses we me agwọ ọla, tukwasi ya n'ọkọlọtọ ahu: o rue, ma ọ buru na agwọ atawo madu, na ọ di ndu, mb͕e ọ legidere agwọ ọla ahu anya. 10 Umu Israel we bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Obot. 11 Ha si n'Obot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Iye-abarim, n'ọzara ahu nke di n'iru Moab, n'uzọ ọwuwa-anyanwu. 12 Ha si n'ebe ahu bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na ndagwurugwu Zered. 13 Ha si n'ebe ahu bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ofè Anon, nke di n'ọzara, nke si n'ókè-ala ndi-Amorait aputa: n'ihi na Anon bu ókè-ala Moab, n'etiti Moab na ndi-Amorait. 14 N'ihi ya ka anāsi n'akwukwọ agha di iche iche nke Jehova, Vaheb nime Sufa, Na ndagwurugwu nile nke Anon, 15 Na nkpọrube nke ndagwurugwu ahu, Bú nke nēwezuga onwe-ya n'uzọ ebe-obibi A, Nke nādabere kwa n'ókè-ala Moab. 16 Ha si n'ebe ahu jerue Bia: nke ahu bu olùlù-miri ahu nke Jehova gwara Moses okwu bayere ya, si, Chikọta ndim, M'gēnye kwa ha miri. 17 Mb͕e ahu Israel nābù abù a, si: Rigo, gi olùlù-miri; zanu ya: 18 Olùlù-miri, ndi-isi gwuru ya, Ndi amara aha-ha nke ndi Israel doziri ya, Ha ji nkpa-n'aka onye nēnye ukpuru, ji kwa nkpa-n'aka nile ha, me ya. Ha si n'ọzara ahu jerue Matana: 19 si na Matana jerue Nahaliel: si na Nahaliel jerue Bamot: 20 si na Bamot jerue ndagwurugwu ahu nke di n'ọhia Moab, rue elu Pisga, nke nēle anya n'ebe ala ahu nke tọb͕ọrọ n'efu di. 21 Israel we ziga ndi-ozi jekuru Saihon, bú eze ndi-Amorait, si, 22 Ka m'gabiga nime ala-gi: ayi agaghi-ewezuga onwe-ayi ba n'ọhia, ma-ọbu n'ubi-vine, ayi agaghi-aṅu miri olùlù-miri: n'uzọ eze ka ayi ganēje, rue mb͕e ayi gāgabiga ókè- ala-gi. 23 Ma Saihon ekweghi ka Israel gabiga nime ókè-ala-ya: ma Saihon chikọtara ndi-ya nile, pua izute Israel rue ọzara, biarue Jehaz: ọ we buso Israel agha. 24 Israel we were ọnu mma-agha tib͕ue ya, we nweta ala-ya site n'Anon rue Jekob, rue umu Amon: n'ihi na ókè-ala umu Amon siri ike. 25 Israel we were obodo ndia nile: Israel we biri n'obodo nile nke ndi-Amorait, nime Heshbon, na nime umu-obodo-ya nile. 26 N'ihi na Heshbon ahu, obodo Saihon, bú eze ndi-Amorait, ka ọ bu, eze ahu buso-kwa-rari eze gara aga Nke Moab agha, we nara ala-ya nile n'aka-ya, rue Anon. 27 N'ihi ya ndi nātu ilu nāsi, Banu nime Heshbon, Ka ewue obodo Saihon, ka eguzosi kwa ya ike: 28 N'ihi na ọku esiwo na Heshbon pua, Ire-ọku n'obodo Saihon: O ripiawo A nke Moab, Ndi-nwe ebe nile di elu nke Anon. 29 Ahuhu gādiri gi, Moab! I lawo n'iyì, gi ndi Kemosh: Ọ nyewo umu-ya ndikom, dika ndi b͕apuru ab͕apu, Nye kwa umu-ya ndinyom ije na ndọta-n'agha, N'aka Saihon, bú eze ndi-Amorait. 30 Ayi ab͕awo ha àkú; Heshbon alawo n'iyì rue Dibon, Ayi emewo ka ọ tọb͕ọrọ n'efu rue Nofa, Nke diruru Medeba. 31 Israel we biri n'ala ndi-Amorait. 32 Moses we ziga iledo Jeza, ha we were umu-obodo-ya nile, napu ndi-Amorait ndi biri n'ebe ahu ala-ha. 33 Ha we chigharia, rigo n'uzọ Bechan: Og, bú eze Beshan, we puta izute ha, ya onwe-ya na ndi-ya nile, ibu agha n'Edrei. 34 Jehova we si Moses, Atula egwu ya; n'ihi na ọ bu n'aka-gi ka M'nyeworo ya, na ndi-ya nile, na ala-ya; i gēme kwa ya dika i mere Saihon, bú eze ndi-Amorait, nke biri nime Heshbon. 35 Ha we tib͕ue ya, na umu-ya ndikom, na ndi-ya nile, rue mb͕e ọ dighi onye fọduru arapuru ya: ha we nweta ala-ya.

Ọnu-Ọgugu 22

1 Umu Israel we bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ala ihe nādighi nke Moab n'ofè Jọdan na nso Jeriko. 2 Belak nwa Zipoa we hu ihe nile Israel mereri ndi-Amorait. 3 Moab we tua ujọ ndi Israel nke-uku, n'ihi na ọtutu ka ha di; ike gwusia Moab n'iru umu Israel. 4 Moab we si ndi-okenye Midian, Ub͕u a nkpọkọta nka gārachapu ihe nile nke di ayi buruburu, dika ehi nārachapu akwukwọ ndu nke ọhia. Belak nwa Zipoa bu kwa eze Moab na mb͕e ahu. 5 Ọ we zigara Belam nwa Beoa ndi-ozi, rue Petoa, nke di n'akuku Osimiri, bú ala nke umu ndi-ya, ikpọ ya, si, Le, otù ndi esiwo n'Ijipt puta: le, ha ekpuchiwo iru ala, ndi ahu nānọ kwa na ncherita-irum: 6 ma ub͕u a, biko, bia, buaram ndi nka ọnu; n'ihi na ndi di ike ka ọ bu karim: eleghi anya m'gēnwe ike, ka ayi we tib͕ue ha, m'we chupu ha n'ala: n'ihi na amawom na onye i nāgọzi bu onye agọziri agọzi, ma onye i nābu ọnu bu onye anābu ọnu. 7 Ndi-okenye Moab na ndi-okenye Midian we je, ihe nile iji ju ase di kwa n'aka-ha; ha we biakute Belam, gwa ya okwu nile nke Belak. 8 o we si ha, Nọnu ọnọdu-abali n'ebe a n'abali a, m'gēweghachi-kwa-ra unu okwu, dika Jehova si agwam okwu: ndi-isi Moab we nọyere Belam. 9 Chineke we biakute Belam, si, Òle ndi bu ndikom ndia nọyere gi? 10 Belam we si Chineke, Belak nwa Zipoa, bú eze Moab, eziteworom ozi, si, 11 Le, ndi ahu nke si n'Ijipt puta, ọ nēkpuchi kwa iru ala: ub͕u a, bia kọcharam ha; eleghi anya m'gēnwe ike ibuso ha agha, m'gāchupu kwa ha. 12 Chineke we si Belam, Esola ha je; abula ndi Israel ọnu; n'ihi na ndi agọziri agọzi ka ha bu. 13 Belam we bilie n'ututu, si ndi-isi Belak, Lanu n'ala-unu: n'ihi na Jehova n'aju ikwe ka m'soro unu je. 14 Ndi-isi Moab we bilie, biakute Belak, si, Belam nāju isoro ayi bia. 15 Belak we ziga kwa ndi-isi ọzọ, di ọtutu, di kwa nsọpuru, kari ndi ahu. 16 Ha we biakute Belam, si ya, Otú a ka Belak nwa Zipoa siri, Biko, ekwela ka ihe b͕ochie gi ibiakutem: 17 n'ihi na m'ghaghi isọpuru gi nke-uku, ọ bu kwa ihe ọ bula i gāsim ka m'gēme: ma, biko, bia, kọcharam ndi nka. 18 Belam we za, si ndi-orù Belak, Ọ buru na Belak enyewo m ojuju ulo-ya nke ọla-ọcha na ọla-edo, apughm igabiga okwu-ọnu nke Jehova, bú Chinekem, ime ihe ntà ma-ọbu ihe uku. 19 Ma ub͕u a, biko, nọdunu n'ebe a, ọbuná unu onwe-unu, abali a, ka m'we mara uka Jehova gākpayere m ọzọ. 20 Chineke we biakute Belam n'abali, si ya, Ọ buru na ọ bu ikpọ gi ka ndikom ahu biara, gi bilie, soro ha je; ma nání okwu nke M'nāgwa gi, nke ahu ka i gēme. 21 Belam we bilie n'ututu, jikwa nne-inyinya-ibu-ya soro ndi-isi Moab je. 22 Iwe Chineke we di ọku n'ihi na ọ nēje: mọ-ozi nke Jehova we guzo onwe-ya n'uzọ ibu onye nēmegide ya. Ma ya onwe-ya nānọkwasi na nne-inyinya-ibu-ya, umu-okorọbia-ya abua so kwa ya. 23 Nne-inyinya-ibu ahu we hu mọ-ozi nke Jehova ka o nēguzo n'uzọ, mma-agha-ya amiputara amiputa di kwa n'aka-ya: nne-inyinya-ibu ahu we wezuga onwe-ya n'uzọ, je n'ọhia: Belam we tie nne-inyinya-ibu ahu ihe, iwezuga ya ba n'uzọ. 24 Mọ-ozi nke Jehova we guzo n'uzọ di warara n'etiti ubi-vine, ogige di n'otú akuku, ogige di kwa n'akuku nke-ọzọ. 25 Nne-inyinya-ibu ahu we hu mọ-ozi nke Jehova, ọ we nuba onwe-ya na mb͕idi, nuba kwa ukwu Belam na mb͕idi ahu: o we tie ya ihe ọzọ. 26 Mọ-ozi nke Jehova we gabiga ọzọ, guzo n'ebe di nkpa, ebe uzọ nādighi madu gēwezuga onwe-ya ga n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe. 27 Nne-inyinya-ibu ahu we hu mọ-ozi nke Jehova, o we makpuru n'okpuru Belam: iwe Belam we di ọku, o were nkpa-n'aka-ya tie nne-inyinya-ibu ahu. 28 Jehova we saghe ọnu nne-inyinya-ibu ahu, ọ we si Belam, Gini ka m'meworo gi, na itiwom ihe ub͕ò atọ ndia? 29 Belam we si nne-inyinya-ibu ahu, N'ihi na i kwaram emò: ọ gādim nọ̄ nma ma asi na mma-agha di n'akam, n'ihi na ub͕u a m'gēb͕uwori gi. 30 Nne-inyinya-ibu ahu we si Belam, Mù onwem abughi nne-inyinya-ibu-gi, nke i nọkwasiworo nam n'ogologo mb͕e-gi rue ta? ànọm nēme gi otú a ma-ọli? Ọ si, É-è. 31 Jehova we saghe anya Belam abua, o we hu mọ-ozi nke Jehova ka ọ nēguzo n'uzọ, mma-agha-ya amiputara amiputa di kwa n'aka-ya: o we rube isi, kpọ isi ala n'iru-ya. 32 Mọ-ozi nke Jehova we si ya, N'ìhi gini ka i tiworo nne-inyinya-ibu-gi ihe ub͕ò atọ ndia? le, mu onwem aputawo ibu onye-nmegide, n'ihi na uzọ-gi nārida na nbibi n'irum: 33 nne-inyinya-ibu-gi we hum, wezuga onwe-ya n'irum ub͕ò atọ ndia: ọ buru na o wezugaghi onwe-ya site n'irum, n'ezie ub͕u a ọ bu kwa gi onwe-gi ka m'gēb͕uwori, ma ya onwe-ya ka m'gēmewori ka ọ di ndu. 34 Belam we si mọ-ozi nke Jehova, Emehiewom; n'ihi na amaghm na gi onwe-gi nēguzo onwe-gi izutem n'uzọ: ma ub͕u a, ọ buru na ọ jọ njọ n'anya-gi, m'gālaghachi n'onwem. 35 Mọ-ozi nke Jehova we si Belam, Soro ndikom ahu je: ma nání okwu ahu nke m'gāgwa gi, nke ahu ka i gēkwu. Belam we soro ndi-isi Belak je. 36 Belak we nu na Belam abiawo, o we pua izute ya rue obodo Moab, nke di n'ókè-ala Anon, nke di na nsọtu ókè-ala ahu. 37 Belak we si Belam, Èziteghm ozi ike ike n'ebe i nọ ikpọ gi? n'ìhi gini ka i nābiakuteghm? ọ̀ bu ezi-okwu na apughm isọpuru gi? 38 Belam we si Belak, abiakutewom i: ub͕u a ọ̀ di ike ọ bula m'nwere ikwu ihe ọ bula? okwu ahu nke Chineke gētiye n'ọnum, nke ahu ka m'gēkwu. 39 Belam we soro Belak je, ha we biarue Kiriat-huzot. 40 Belak we chua ìgwè ehi na ìgwè ewu na aturu n'àjà, we zigara Belam, ziga-kwa-ra ndi-isi ndi ha na ya nọ. 41 O rue, n'ututu, na Belak kuru Belam, me ka ọ rigo na Bamot-beal, ọ we si n'ebe ahu hu nsọtu ndi Israel.

Ọnu-Ọgugu 23

1 Belam we si Belak, Wuerem ebe-ichu-àjà asa n'ebe a, dozi-kwa-ram oke-ehi asa na ebulu asa n'ebe a. 2 Belak we me dika Belam kwuru; Belak na Belam we sure otù oke-ehi na otù ebulu ọku n'ebe-ichu-àjà ọ bula. 3 Belam we si Belak, Guzo onwe-gi n'akuku àjà-nsure-ọku-gi, ma ka m'je; eleghi anya Jehova gābia izutem: ma ihe ọ bula Ọ gēme ka m'hu m'gēgosi kwa gi ya. Ọ we je ugwu nke ọhia nādighi. 4 Chineke we zute Belam: ọ we si Ya, Ebe-ichu-àjà asa ahu ka m'doworo n'usoro, m'we sure otù oke-ehi na otù ebulu ọku n'ebe-ichu-aja ọ bula. 5 Jehova we tiye okwu n'ọnu Belam, si, Jeghachikuru Belak, ọ bu kwa otú a ka i gēkwu. 6 Ọ we jeghachikuru ya, ma, le, ọ nēguzo n'akuku àjà-nsure-ọku-ya, ya onwe-ya na ndi-isi Moab nile. 7 O we tua ilu-ya, si, N'Eram ka Belak nēsi dutem, Eze Moab si n'ugwu Iru-anyanwu dutem: si, Bia, buaram Jekob ọnu, Bia kwa, wesa Israel iwe. 8 Gini, m'gākọcha? Chineke akọchaghi. Gini kwa m'gēwe iwe? Jehova eweghi iwe. 9 N'ihi na n'elu oké nkume ndia ka m'si ahú ya, Ọ bu kwa n'ugwu ntà ndia ka m'si ekiri ya: Le, otù ndi ka ọ bu, ọ nēbi iche, Ọ dighi-agu onwe-ya n'etiti mba nile. 10 Ònye gutaworo ájá Jekob, Na ọnu-ọgugu nke otù uzọ n'uzọ anọ nke Israel? Ka mu onwem nwua, ọnwu nke ndi ziri ezi, Ka ikpe-azum di kwa ka nke ya! 11 Belak we si Belam, Gini ka i meworom? ọ bu ikọcha ndi-irom ka m'kutere gi, ma, le, i gọziwo ha nke-uku. 12 Ọ we za, si, Ihe Jehova nētiye n'ọnum, ọ̀ bughi nka ka m'gēlezi anya ikwu? 13 Belak we si ya, Biko, sorom je n'ebe ọzọ, ebe i gēsi hu ha; nání nsọtu-ha ka i gāhu, ma i gaghi-ahu ha nile: gi kọcha-kwa-ram ha site n'ebe ahu. 14 Ọ we kuru ya je ọhia Zofim, rue elu Pisga, o wue ebe-ichu-àjà asa, sure otù oke-ehi na otù ebulu ọku n'ebe-ichu-àjà ọ bula. 15 Ọ si Belak, Guzo onwe-gi n'ebe a n'akuku àjà-nsure-ọku-gi, ma mu onwem gēzute Jehova n'ebe ahu. 16 Jehova we zute Belam, tiye okwu n'ọnu-ya, si, Jeghachikuru Belak, ọ bu kwa otú a ka i gēkwu. 17 Ọ we biakute ya, ma, le, ọ nēguzo n'akuku àjà-nsure-ọku-ya, ya na ndi-isi Moab. Belak we si ya, Gini ka Jehova kwuworo? 18 Ọ we tua ilu-ya, si, Bilie, Belak, nuru kwa; Ṅam nti, nwa Zipoa: 19 Chineke abughi madu, nke O gēkwu okwu-ugha; Ọ bughi kwa nwa madu, nke Ọ gēlogha: Ọ̀ bu na Ya onwe-ya asiwo na Ọ gēme ihe, ma O meghi ya? Ma-ọbu Ò kwuwo okwu, ma O meghi ya ka o guzosie ike? 20 Le, ọ bu igọzi ka m'nataworo iwu: Ọ gọziwo kwa, apughkwam itughari ya. 21 O legideghi ajọ ihe anya nime Jekob, Ọ hughi kwa nmeb͕u n'Israel: Jehova, bú Chineke-ya, nọyere ya, Iti-nkpu nke eze di kwa n'etiti ha. 22 Chineke nēme ka ha si n'ala Ijipt puta; Ume dika ume atu ka ọ nwere 23 N'ihi na ọb͕ub͕a-afa adighi megide Jekob, Iju-ase adighi kwa megide Israel: Na mb͕e ahu ka agēkwu okwu bayere Jekob, baye-kwa-ra Israel, si, Le ihe Chineke meworo! 24 Le, ndi ahu nēbili dika nne-ọdum, Dika ọdum ka ọ nēweli onwe-ya: Ọ gaghi-edina rue mb͕e ọ gēri ihe ọ dọb͕utara, Ṅu kwa ọbara nke ndi eb͕uru eb͕u. 25 Belak we si Belam, Akọcha-kwa-la ha ma-ọli agọzi-kwa-la ha ma-ọli. 26 Belam we za, si Belak, Àgwaghm i, si, Ihe nile nke Jehova gēkwu, nke ahu ka m'gēme? 27 Belak we si Belam, Biko, bia, m'gēkuru gi je ebe ọzọ; eleghi anya ọ gēzi ezi n'anya Chineke ka i si n'ebe ahu kọcharam ha. 28 Belak we kuru Belam je n'elu Peoa, nke nēle anya n'ebe ala ahu nke tọb͕ọrọ n'efu di. 29 Belam we si Belak, Wuerem ebe-ichu-àjà asa n'ebe a, dozi-kwa-ram oke-ehi asa na ebulu asa n'ebe a. 30 Belak we me dika Belam siri, ọ we sure otù oke-ehi na otù ebulu n'ebe-ichu-aja ọ bula.

Ọnu-Ọgugu 24

1 Ma mb͕e Belam huru na ọ di nma n'anya Jehova igọzi Israel, ọ jeghi, dika o si eje ub͕ò ub͕ò, izute ọb͕ub͕a-afa di iche iche, ma o chere iru-ya n'ọzara. 2 Belam we welie anya-ya abua, hu Israel ka ha nānọ n'ulo-ikwū-ha dika ebo nile ha si di; Mọ nke Chineke we dikwasi ya. 3 Ọ we tua ilu-ya, si, Ihe nke si n'ọnu Belam nwa Beoa puta, Bú ihe nke si n'ọnu nwoke ahu puta, onye anya-ya mechiri emechi: 4 Ihe nke si n'ọnu-ya puta, bú onye nānu okwu-ọnu nile nke Chineke, Onye nāhu ọhù nke Onye ahu Nke puru ime ihe nile, Mb͕e ọ nāda, ma anya-ya abua saghere asaghe: 5 Le ka ulo-ikwū-gi nile si ma nọ̄ nma, Jekob! Le ka ebe-obibi-gi nile si ma nọ̄ nma, Israel! 6 Dika ndagwurugwu di iche iche ka esetiworo ha, Dika ubi di iche iche ab͕ara ogige n'akuku osimiri, Dika osisi lign-aloes nke Jehova kuworo, Dika osisi cedar n'akuku miri. 7 Miri nēsi n'ite-miri-ya nile rùputa, Nkpuru-ya gādi kwa n'ọtutu miri, Eze-ya gādi kwa elu kari Egag, Agēbuli kwa ala-eze-ya. 8 Chineke nēme ka o si n'Ijipt puta; Ume dika ume atu ka ọ nwere: O gēripia mba di iche iche, bú ndi nākpab͕u ya, Ọ bu kwa ọkpukpu nile ha ka ọ gēkpecha, Were kwa àkú-ya nile b͕arua ha aru. 9 Ọ makpuru, o dinara dika ọdum, Na dika nne-ọdum; ònye gēme ka o bilie? Onye ọ bula nke nāgọzi gi bu onye agọziri agọzi, Onye ọ bula nke nābu gi ọnu bu kwa onye anābu ọnu. 10 Iwe Belak we di ọku megide Belam, ọ kua aka-ya abua: Belak we si Belam, Ọ bu ikọcha ndi-irom ka m'kpọrọ gi, ma, le, i gọziwo ha nọ̄ ub͕ò atọ ndia. 11 Ma ub͕u a, b͕alaga n'onwe-gi la n'ebe nke gi: asirim na m'gāsọpuru gi nke-uku; ma, le, Jehova eb͕ochiwo gi na nsọpuru. 12 Belam we si Belak, Ọ̀ bughi kwa ndi-ozi-gi, bú ndi i ziterem, ka m'gwara okwu, si, 13 Ọ buru na Belak enyem ojuju ulo-ya nke ọla-ọcha na ọla-edo, apughm igabiga okwu-ọnu Jehova, ime ezi ihe ma-ọbu ihe ọjọ site n'obi nke akam, ihe nke Jehova gēkwu, nke ahu ka m'gēkwu? 14 Ma ub͕u a, le, anamalakuru ndim: bia, m'gādu gi ọdu ihe ndi nka gēme ndi-gi na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia. 15 Ọ we tua ilu-ya, si, Ihe nke si n'ọnu Belam nwa Beoa puta, Bú ihe nke si n'ọnu nwoke ahu puta, onye anya-ya mechiri emechi: 16 Ihe nke si n'ọnu-ya puta, bú onye nānu okwu-ọnu nile nke Chineke, Onye nāma kwa ihe-ọmuma nke Onye kachasi ihe nile elu, Ọhù nke Onye ahu Nke puru ime ihe nile ka ọ nāhu, Mb͕e ọ nāda, ma anya-ya abua saghere asaghe: 17 Anamahu ya, ma ọ bughi ub͕u a: Anamekiri ya, ma ọ bughi na nso: Otù kpakpando gēsi na Jekob zọlie ije, Nkpa-n'aka eze gēsi kwa n'Israel bilie, We mapue akuku nile nke Moab, Gwuda kwa umu ọkpukpọ-ùzù nile, 18 Edom gābu kwa ihe-nnweta, Sia gābu kwa ihe-nnweta, bú ndi-iro-ya; Israel nēme kwa ihe-dìnkpà. 19 Otù onye gēsi kwa na Jekob zọda mba nile, Ọ geme kwa ka ndi foduru si n'obodo lapu n'iyì. 20 Ọ we hu Amalek, we tua ilu-ya, si, Mba mbu nke mba nile ka Amalek bu; Ma ikpe-azu-ya gābiaru ila-n'iyì. 21 Ọ we hu ndi-Kinait, we tua ilu-ya, si, Ebe nke nādigide adigide ka ebe-obibi-gi di, Etiye-kwa-ra akwu-gi na nkume di elu. 22 Ma otú ọ di, Ken gābu ihe irechapu ọku, Rùe ole mb͕e? Asiria gādọta gi n'agha. 23 Ọ we tua ilu-ya, si, Ewū! ònye gādi ndu site na mb͕e Chineke nēdo ya? 24 Ma ub͕ọ ufọdu gēsi n'akuku Kitim bia, Ha gēweda kwa Asiria n'ala, weda kwa Iba n'ala, Ọzọ kwa, ya onwe-ya gābiaru ila-n'iyì. 25 Belam we bilie, je, laghachi n'ebe-ya; ọzọ kwa, Belak jere n'uzọ-ya.

Ọnu-Ọgugu 25

1 Israel we biri na Shitim, ndi Israel we malite isoro umu-ndinyom Moab nākwa iko: 2 ndinyom ahu we kpọ ndi Israel ibia n'àjà chi nile ha; ndi Israel we rie ihe, kpọ isi ala nye chi nile ha. 3 Israel we kekọta onwe-ya n'aru Beal-peoa: iwe Jehova we di ọku megide Israel. 4 Jehova we si Moses, Chiri ndi-isi nile nke ndim, kpọgidere ha Jehova n'iru anyanwu, ka idi-ọku nke iwe Jehova we si n'aru Israel laghachi. 5 Moses we si ndi-ikpé Israel, B͕uenu, onye ọ bula ya b͕ue ndikom-ya ndi nēkekọta onwe-ha n'aru Beal-peoa. 6 Ma, le, otù nwoke nime umu Israel biara, weta nso umu-nne-ya otù nwayi Midian n'anya Moses, na n'anya nzukọ nile nke umu Israel, mb͕e ha onwe ha nākwa ákwá n'ọnu-uzọ ulo-kwū nzute. 7 Finehas, nwa-nwoke Eleeza, nwa Eron, bú onye-nchu-àjà, we hu ya, o we si n'etiti nzukọ Israel bilie, were ube n'aka-ya, 8 soro nwoke Israel ahu ba nime ulo-ndina-ya, mapue ha abua, bú nwoke Israel ahu, na nwayi ahu rue ime-afọ-ya. Ewe b͕ochie ihe otiti ahu n'aru umu Israel. 9 Ma ndi nwuru n'ihe-otiti ahu di orú nnù uzọ atọ. 10 Jehova we gwa Moses okwu, si, 11 Finehas, nwa Eleeza, nwa Eron, bú onye-nchu-àjà, emewo ka ọnumam si n'aru umu Israel laghachi, n'iwere ekworom kwo ekworo n'etiti ha, M'we ghara ime ka umu Israel gwusia n'ekworom. 12 N'ihi ya si ya, Le, anamenye ya ọb͕ub͕a-ndum nke udo: 13 ọ gāburu ya, buru kwa nkpuru-ya gānọchi ya, ọb͕ub͕a-ndu ọlu-nchu-àjà ebighi-ebi; n'ihi na o kworo ekworo bayere Chineke-ya, kpuchi-kwa-ra umu Israel nmehie-ha. 14 Ma aha nwoke Israel ahu nke etib͕uru etib͕u, onye etib͕uru ya na nwayi Midian, bu Zimri, nwa Salu, bú onye-isi nke otú ulo nna nke ndi Simeon. 15 Aha nwayi Midian ahu nke etib͕uru etib͕u bu Kọzbi, nwa Zua; onye-isi mba nke otù ulo nna na Midian ka ọ bu. 16 Jehova we gwa Moses okwu, si, 17 Kpab͕ue ndi Midian, tib͕u kwa ha: 18 n'ihi na ha nākpab͕u unu n'aghughọ nile ha, nke ha ji ghọb͕u unu n'okwu Peoa, na n'okwu kọzbi, bú nwa-nwayi onye-isi Midian, nwa-nne-ha nwayi, nke etib͕uru n'ubọchi ihe-otiti ahu n'okwu Peoa.

Ọnu-Ọgugu 26

1 O rue, mb͕e ihe-otiti ahu gasiri, na Jehova gwara Moses na Eleeza nwa Eron, bú onye-nchu-àjà, okwu, si, 2 Gutanu ọnu-ọgugu nzukọ nile nke umu Israel, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, onye ọ bula nke nāpukuru usu-ndi-agha n'Israel. 3 Moses na Eleeza, bú onye-nchu-àjà, we kpayere ha uka n'ala ihe nādighi nke Moab n'akuku Jọdan na nso Jeriko, si, 4 Gutanu ọnu-ọgugu ndi Israel, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru; dika Jehova nyere Moses na umu Israel iwu, bú ndi nēsi n'ala Ijipt puta. 5 Reuben, bú ọkpara Israel: umu-ndikom Reuben; nke Hanok bu ab͕uru ndi Hanok: nke Palu bu ab͕uru ndi Palu: 6 nke Hezron bu ab͕uru ndi Hezron: nke Kami bu ab͕uru ndi Kami. 7 Ndia bu ab͕uru ndi Reuben: ndi-ha agukọtara agukọta we di orú nnù uzọ ise, na nnù iteghete, na ọgu isi, na iri. 8 Umu ndikom Palu kwa; Eliab. 9 Umu-ndikom Eliab; Nemuel, na Detan, na Abairam. Ndia bu Detan ahu na Abairam ahu, ndi akpọrọ nke nzukọ Israel, ndi lusoro Moses, luso kwa Eron, ọ̀gù nime nzukọ Kora, mb͕e ha lusoro Jehova ọ̀gù: 10 ala we saghe ọnu-ya, loda ha na Kora, mb͕e nzukọ ahu nwuru; mb͕e ọku ahu ripiara ọgu ndikom iri-na-abua na iri ahu, ha we ghọ ihe-iriba-ama. 11 Ma umu-ndikom Kora anwughi. 12 Umu-ndikom Simeon, dika agburu nile ha si di: nke Nemuel bu ab͕uru ndi Nemuel: nke Jamin bu ab͕uru ndi Jamin: nke Jakin bu ab͕uru ndi Jakin: 13 nke Zera bu ab͕uru ndi Zera: nke Shaul bu ab͕uru ndi Shaul. 14 Ndia bu ab͕uru ndi Simeon, orú nnù uzọ abua, na nnù iri-na-ise, na ọgu iri. 15 Umu-ndikom Gad, dika ab͕uru nile ha si di: nke Zefon bu ab͕uru ndi Zefon: nke Hagi bu ab͕uru ndi Hagi: nke Shuni bu ab͕uru ndi Shuni: 16 nke Ọzni bu ab͕uru ndi Ọzni: nke Iri bu ab͕uru ndi Iri: 17 nke Arod bu ab͕uru ndi Arod: nke Areli bu ab͕uru ndi Areli. 18 Ndia bu ab͕uru umu-ndikom Gad, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, orú nnù uzọ ise, na nnu, na ọgu ise. 19 Umu-ndikom Juda, Ia na Onan: ma Ia na Onan nwuru n'ala Kenean. 20 Umu-ndikom Juda, dika ab͕uru nile ha si di, bu; nke Shila bu ab͕uru ndi Shila: nke Perez bu ab͕uru ndi Perez: nke Zera bu ab͕uru ndi Zera. 21 Umu-ndikom Perez bu kwa; nke Hezron bu ab͕uru ndi Hezron: nke Hamul bu ab͕uru ndi Hamul. 22 Ndia bu ab͕uru Juda, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, orú nnù uzọ iteghete, na nnù iri-na-otù, na ọgu ise. 23 Umu-ndikom Isaka, dika ab͕uru nile ha si di: nke Tola bu ab͕uru ndi Tola: nke Puva bu ab͕uru ndi-Punait: 24 nke Jashub bu ab͕uru ndi Jashub: nke Shimron bu ab͕uru ndi Shimron. 25 Ndia bu ab͕uru Isaka, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, orú nnù uzọ asatọ, na ọgu iri-na-ise. 26 Umu-ndikom Zebulun, dika ab͕uru nile ha si di: nke Sered bu ab͕uru ndi Sered: nke Ilon bu ab͕uru ndi Ilon: nke Jahleel bu ab͕uru ndi Jahleel. 27 Ndia bu ab͕uru ndi Zebulun, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, orú nnù uzọ asa, na nnù iri-na-otù, na ọgu ise. 28 Umu-ndikom Josef, dika ab͕uru nile ha si di: Manase na Efraim. 29 Umu-ndikom Manase: nke Makia bu ab͕uru ndi Makia: Makia we muta Gilead: nke Gilead bu ab͕uru ndi Gilead. 30 Ndia bu umu-ndikom Gilead: nke Ieza bu ab͕uru ndi Ieza: nke Hilek bu ab͕uru ndi Hilek. 31 nke Asriel bu ab͕uru ndi Asriel: nke Shekem bu ab͕uru ndi Shekem: 32 nke Shemida bu ab͕uru ndi Shemida: nke Hefa bu ab͕uru ndi Hefa. 33 Ma Zelọfehad nwa Hefa enweghi umu-ndikom, ma ọ nwere umu-ndinyom: aha umu-ndinyom Zelọfehad bu Mahla, na Noa, na Họgla, na Milka, na Tiaza. 34 Ndia bu ab͕uru Manase: ndi-ha agukọtara agukọta we di orú nnù uzọ isi, na nnù iri-na-otù, na ọgu iri-na-ise. 35 Ndia bu umu-ndikom Efraim, dika ab͕uru nile ha si di: nke Shutela bu ab͕uru ndi Shutela: nke Beka bu ab͕uru ndi Beka: nke Tahan bu ab͕uru ndi Tahan. 36 Ndia bu umu-ndikom Shutela: nke Iran bu ab͕uru ndi Iran. 37 Ndia bu ab͕uru umu-ndikom Efraim, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, orú nnù uzọ anọ, na nnù, na ọgu ise. Ndia bu umu-ndikom Josef, dika ab͕uru nile ha si di. 38 Umu-ndikom Benjamin, dika ab͕uru nile ha si di: nke Bela bu ab͕uru ndi Bela: nke Ashbil bu ab͕uru ndi Ashbil: nke Ahairam bu ab͕uru ndi Ahairam: 39 nke Shefufan bu ab͕uru ndi-Shufamait: nke Hufan bu ab͕uru ndi Hufan. 40 Umu-ndikom Bela bu Ad na Neaman: nke Ad bu ab͕uru ndi Ad: nke Neaman bu ab͕uru ndi Neaman. 41 Ndia bu umu-ndikom Benjamin, dika ab͕uru nile ha si di: ndi-ha agukọtara agukọta we di orú nnù uzọ ise, na nnù iri-na-anọ. 42 Ndia bu umu-ndikom Dan, dika ab͕uru nile ha si di: nke Shuham bu ab͕uru ndi Shuham. Ndia bu ab͕uru nke Dan, dika ab͕uru nile ha si di. 43 Ab͕uru nile nke ndi Shuham, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, di orú nnù uzọ asatọ, na otù nnù. 44 Umu-ndikom Asha, dika ab͕uru nile ha si di: nke Imna bu ab͕uru ndi Imna: nke Ishvi bu ab͕uru ndi Ishvi: nke Beria bu ab͕uru ndi Beria. 45 Nke umu-ndikom Beria: nke Hiba bu ab͕uru ndi Hiba: nke Malkiel bu ab͕uru ndi Malkiel. 46 Ma aha nwa-nwayi Asha bu Sera. 47 Ndia bu ab͕uru umu-ndikom Asha, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, orú nnù uzọ isi, na nnù iri-na-atọ, na ọgu iri. 48 Umu-ndikom Naftali, dika ab͕uru nile ha si di: nke Jahzeel bu ab͕uru ndi Jahzeel: nke Guni bu ab͕uru ndi Guni: 49 nke Jiza bu ab͕uru ndi Jiza: nke Shilem bu ab͕uru ndi Shilem. 50 Ndia bu ab͕uru Naftali, dika ab͕uru nile ha si di: ndi-ha agukọtara agukọta we di orú nnù uzọ ise, na nnù iri-na-atọ, na ọgu iri. 51 Ndia bu ndi agukọtara agukọta nke umu Israel, orú nnù ogu uzọ atọ na uzọ iri-na-ise, na nnù anọ, na ọgu isi, na iri. 52 Jehova we gwa Moses okwu, si, 53 Ndia ka agēkere ala ahu n'ihe-nketa, n'ọnu-ọgugu aha. 54 Ndi bara uba ka i gēme ka ala-nketa-ha rie nne, ma ndi di ole-na-ole ka i gēme ka ala-nketa-ha di ntà; agēnye nwoke ọ bula ala-nketa-ya, dika ndi-ya agukọtara agukọta si di. 55 Nání ọ bu n'ife-nzà ka agēkè ala ahu: dika aha nile nke ebo nile nke ndi bu nna-ha si di ka ha gēketa. 56 Dika ife-nzà si di ka agēkè ihe-nketa-ha n'etiti ndi bara uba na ndi di ole-na-ole. 57 Ndia bu ndi agukọtara agukọta nke ndi Livai dika ab͕uru nile ha si di: nke Giashon bu ab͕uru ndi Giashon: nke Kohat bu ab͕uru ndi Kohat: nke Merari bu ab͕uru ndi Merari. 58 Ndia bu ab͕uru Livai: ab͕uru ndi Libni, ab͕uru ndi Hebron, ab͕uru ndi Mahli, ab͕uru ndi Mushi, ab͕uru ndi Kora. Kohat we mua Amram. 59 Aha nwunye Amram bu Jokebed, nwa Livai, nke amuru ya nye Livai n'Ijipt: nwayi ahu we muara Amram Eron na Moses, na Miriam, bú nwa-nne-ha nwayi. 60 Amu-kwa-ra nye Eron Nebad na Abaihu na Eleeza na Itama. 61 Nedab na Abaihu we nwua mb͕e ha wetara nso n'iru Jehova ọku ala ọzọ. 62 Ndi-ha agukọtara agukọta di orú nnù uzọ abua, na nnù iri-na-asa, na ọgu iri nwoke ọ bula site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru: n'ihi na agukọtaghi ha n'etiti umu Israel, n'ihi na enyeghi ha ihe-nketa n'etiti umu Israel. 63 Ndia bu ndi Moses na Eleeza, bú onye-nchu-àjà, gukọtara; ndi gukọtara umu Israel n'ala ihe nādighi nke Moab n'akuku Jọdan na nso Jeriko. 64 Ma n'etiti ndia ọ dighi nwoke ọ bula di sitere na ndi Moses na Eron, bú onye-nchu-àjà, gukọtara; ndi gukọtara umu Israel n'ọzara Sainai. 65 N'ihi na Jehova kwuru okwu bayere ha, si, Ha aghaghi inwu n'ọzara nka. Ọ dighi kwa nwoke ọ bula fọduru nime ha, ma-ọbughi nání Keleb nwa Jefune na Joshua nwa Nun.

Ọnu-Ọgugu 27

1 Ha we biarue nso, bú umu-ndinyom Zelọfehad, nwa Hifa, nwa Gilead, nwa Makia, nwa Manase, nke ab͕uru Manase nwa Josef: ndia bu aha umu-ya ndinyom; Mahla, na Noa, na Họgla, na Milka, na Tiaza. 2 Ha we guzo n'iru Moses, na n'iru Eleeza, bú onye-nchu-aja, na n'iru ndi-isi na nzukọ Israel nile, n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, si, 3 Nna-ayi nwuru n'ọzara, ma ya onwe-ya adighi n'etiti nzukọ ahu ndi nēzukọ imegide Jehova nime nzukọ Kora: ma nime nmehie nke aka ya ka ọ nwuru: ma ọ dighi umu-ndikom o nwere. 4 N'ìhi gini ka agāgupu aha nna-ayi n'etiti ab͕uru-ya, n'ihi na o nweghi nwa-nwoke? Nye ayi ihe-onwunwe n'etiti umu-nne-nna-ayi ndikom. 5 Moses we weta ikpé-ha nso n'iru Jehova. 6 Jehova we gwa Moses okwu, si, 7 Ọ bu ihe ziri ezi ka umu-ndinyom Zelọfehad nēkwu: i ghaghi inye ha ihe-onwunwe nke ihe-nketa n'etiti umu-nne nna-ha ndikom; i gēme kwa ka ihe-nketa nna-ha gabiga rue ha aka. 8 Ọ bu kwa umu Israel ka i gāgwa okwu, si, Mb͕e nwoke gānwu, ma o nweghi nwa-nwoke, unu gēme kwa ka ihe-nketa-ya gabiga rue nwa-ya nwayi aka. 9 Ma ọ buru na o nweghi nwa-nwayi, unu gēnye kwa umunne-ya ndikom ihe-nketa-ya. 10 Ma ọ buru na ọ nweghi umu-nne-ndikom, unu gēnye kwa umu-nne nna-ya ndikom ihe-nketa-ya. 11 Ma ọ buru na nna-ya enweghi umu-nne-ndikom, unu gēnye kwa onye-aru-ya nke di ya nso site n'ab͕uru-ya ihe-nketa-ya, ọ gēnweta kwa ya: ọ gābu-kwa-ra umu Israel ukpuru ikpé, dika Jehova nyere Moses iwu. 12 Jehova we si Moses, Rigo n'ugwu Abarim nka, hu kwa ala ahu nke M'nyeworo umu Israel. 13 Ma mb͕e i huworo ya, agāchikọta kwa gi na umu-nna-gi n'ala-mọ, ọbuná gi onwe-gi, dika achikọtara Eron, bú nwa-nne-gi na umu-nna-ya: 14 n'ihi na unu nupuru isi n'okwu-ọnum n'ọzara Zin, n'ise-okwu ahu nke nzukọ Israel, bú nke M'gwara unu me, idom nsọ na miri ahu n'anya-ha (Miri ahu bu miri Meriba Kedesh n'ọzara Zin. ) 15 Moses we gwa Jehova okwu, si, 16 Ka Jehova, bú Chineke nke mọ anu-aru nile, bú madu, nwere, Ya me otù nwoke ka ọ buru onye-nlekọta nzukọ a, 17 onye ganāpu apu n'iru ha, onye ganābà kwa abà n'iru ha, onye ganēme kwa ka ha nāpu apu, onye ganēme kwa ka ha nābà abà; ka nzukọ Jehova we ghara idi ka ìgwè ewu na aturu nke nēnweghi onye-ọzùzù. 18 Jehova we si Moses, Kuru n'onwe-gi Joshua nwa Nun, bú nwoke nke Mọm di nime ya, bikwasi ya aka-gi; 19 guzo kwa ya n'iru Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na n'iru nzukọm nile; nye ya iwu n'anya-ha. 20 I gātukwasi kwa ya ufọdu nime ebube-gi, ka nzukọ nile nke umu Israel we nu. 21 Ọ bu kwa n'iru Eleeza, bú onye-nchu-àjà, ka ọ gēguzo, onye gājuru ya ase n'ikpé Ìhe ahu n'iru Jehova: n'okwu-ọnu-ya ka ha ganāpu apu, ọ bu kwa n'okwu-ọnu-ya ka ha ganābà-abà, ya onwe-ya, na umu Israel nile tiyere ya, bú nzukọm nile. 22 Moses we me dika Jehova nyere ya iwu: o we kuru Joshua, guzo ya n'iru Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na n'iru nzukọ Israel nile: 23 o we bikwasi ya aka-ya abua, nye kwa ya iwu, dika Jehova kwuru n'aka Moses.

Ọnu-Ọgugu 28

1 Jehova we gwa Moses okwu, si, 2 Nye umu Israel iwu, si ha, Onyinyem iji biaru nso, nrim iji chu àjà-ọkum nile, bú ihe ísì utọ nkem, unu gēlezi anya iweta ya nsom na mb͕e-ya akara àkà. 3 I gāsi kwa ha, Nka bu àjà-ọku nke unu gēweta nso Jehova; umu-aturu abua nke b͕ara otù arọ, nke zuru okè, kwa-ubọchi, ibu àjà-nsure-oku anēsure mb͕e dum. 4 Otù nime umu-aturu ahu ka i gāchu n'ututu, chu kwa nwa-aturu nke-ọzọ n'etiti ehihie na anyasi; 5 na otù uzọ n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour agwara n'otù uzọ n'uzọ anọ nke otù hin nke manu asuru asu ka ọ buru onyinye-inata-iru-oma. 6 Ọ bu àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, nke emere n'ugwu Sainai ka ọ buru ihe ísì utọ, bú àjà-ọku anāchuru Jehova. 7 Àjà-ihe-ọṅuṅu-ya kwa, otú uzọ n'uzọ anọ nke otù hin gādiri otù nwa-aturu ahu: n'ebe nsọm ka i gāwusiri Jehova àjà-ihe-ọṅuṅu nke ihe-ọṅuṅu nāba n'anya. 8 Nwa-aturu nke-ọzọ ka i gāchu kwa n'etiti ehihie na anyasi: dika onyinye-inata-iru-ọma enyere n'ututu, na dika àjà-ihe-ọṅuṅu-ya, otú a ka i gēme ya, ibu àjà-ọku nke ihe ísì utọ anēsurere jehova. 9 N'ubọchi-izu-ike kwa: umu-aturu abua nke b͕ara otú arọ, nke zuru oké, na uzọ abua n'uzọ iri nke otú ephah utu ọka flour ibu onyinye-inata-iru-oma, nke agwara manu, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya: 10 nka bu àjà-nsure-ọku ubọchi-izu-ike kwa-ubọchi-izu-ike, tiyere àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya. 11 Ọzọ, na nmalite ọnwa-unu nile unu gēweta nso àjà-nsure-ọku isurere Jehova; umu-oke-ehi abua, na otù ebulu, na umu-aturu asa nke b͕ara otù arọ, nke zuru okè; 12 na uzọ atọ n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour, bú onyinye-inata-iru-ọma, nke agwara manu, iji chu oke-ehi ọ bula; na uzọ abua n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour, bú onyinye-inata-iru-ọma, nke agwara manu, iji chu otù ebulu; 13 na otù uzọ n'uzọ iri, otù uzọ n'uzọ iri, nke otù ephah utu ọka flour, bú onyinye-inata-iru-ọma, nke agwara manu, iji chu nwa-aturu ọ bula; ọ bu àjà-nsure-ọku, ihe ísì utọ, àjà-ọku anāchuru Jehova. 14 Àjà-ihe-ọṅuṅu-ha gābu kwa nkera otù hin manya-vine iji chu otú oke-ehi, na otú uzọ n'uzọ atọ nke hin iji chu ebulu ahu, na otù uzọ n'uzọ anọ nke hin iji chu otù nwa-aturu: nka bu àjà-nsure-ọku ọnwa kwa-ọnwa anēsure n'ọnwa nile nke arọ. 15 Otù nkpi kwa iji chu àjà-nmehie nye Jehova; agāchu ya tiyere àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya. 16 Ọzọ, n'ọwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa, ka ngabiga nke diri Jehova gādi. 17 N'ubọchi nke iri-na-ise nke ọnwa ahu ka ememe gādi: ubọchi asa ka agēri achicha ekoghi-eko. 18 N'ubọchi mbu nkpọkọta nsọ gādi; ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje: 19 ma unu gēweta nso àjà-ọku, bú àjà nsure-ọku anēsurere Jehova; umu-oke-ehi abua, na otù ebulu, na umu-aturu asa nke b͕ara otù arọ: nke zuru okè ka ha gāburu unu: 20 na onyinye-inata-iru-ọma-ha, bú utu ọka flour agwara manu: uzọ atọ n'uzọ iri ka unu gāchu bayere otù oke-ehi, ọ bu kwa uzọ abua n'uzọ iri ka unu gāchu bayere ebulu ahu; 21 ọ bu kwa otù uzọ n'uzọ iri, otù uzọ n'uzọ iri, ka unu gāchu bayere nwa-aturu ọ bula nime umu-aturu asa ahu; 22 na otù nkpi iji chu àjà-nmehie, ikpuchiri unu nmehie-unu. 23 Unu gāchu ndia nāgughi àjà-nsure-ọku ututu, nke bu àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum. 24 Dika ihe ndia si di ka unu ganāchu kwa-ubọchi, ubọchi asa, nri nke àjà-ọku, nke ihe ísì utọ anēsurere Jehova: agāchu ya tiyere àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na àjà ihe-ọṅuṅu-ya. 25 N'ubọchi nke-asa nkpọkọta nsọ gādi-kwa-ra unu; ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje. 26 Ọzọ, n'ubọchi nkpuru mbu, mb͕e unu nēweta nso Jehova onyinye-inata-iru-ọma ọhu n'ememe izú asa nke ubọchi asa unu, nkpọkọta nsọ gādiri unu; ọ dighi ozi ọ bula nke òfufè unu gēje: 27 unu gēweta kwa nso àjà-nsure-ọku ibu ihe ísì utọ anēsurere Jehova; umu-oke-ehi abua, otù ebulu, umu-aturu asa nke b͕ara otù arọ; 28 na onyinye-inata-iru-ọma-ha, bú utu ọka flour agwara manu, uzọ atọ n'uzọ iri iji chu otù oke-ehi, uzọ abua n'uzọ iri iji chu otù ebulu ahu, 29 otù uzọ n'uzọ iri, otù uzọ n'uzọ iri, iji chu nwa-aturu ọ bula nime umu-aturu asa ahu; 30 otú nkpi, iji kpuchiri unu nmehie-unu. 31 Unu gāchu ha nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, (nke zuru okè ka ha gāburu unu), na àjà-ihe-ọṅuṅu-ha.

Ọnu-Ọgugu 29

1 Ọzọ, n'ọnwa nke-asa, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, nkpọkọta nsọ gādiri unu; ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje: ubọchi uda-opì ka ọ gāburu unu. 2 Unu gēme àjà-nsure-ọku ibu ihe ísì utọ anēsurere Jehova; otù nwa-oke-ehi, otú ebulu, umu-aturu asa nke b͕ara otù arọ nke zuru okè: 3 na onyinye-inata-iru-ọma-ha, bú utu ọka flour agwara manu, uzọ atọ n'uzọ iri iji chu oke-ehi ahu, uzọ abua n'uzọ iri iji chu ebulu ahu, 4 na otù uzọ n'uzọ iri iji chu nwa-aturu ọ bula nime umu-aturu asa ahu: 5 na otù nkpi iji chu àjà-nmehie, ikpuchiri unu nmehie-unu: 6 nāgughi àjà-nsure-ọku ọnwa ọhu, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha, dika ikpé-ha si di, ibu ihe isì utọ, àjà-ọku anāchuru Jehova. 7 Ọzọ, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa nke-asa nka nkpọkọta nsọ gādiri unu; unu gēweda kwa nkpuru-obi-unu n'ala; ọ dighi kwa ozi ọ bula unu gēje. 8 ma unu gēweta nso àjà-nsure-ọku isurere Jehova, bú ihe ísì utọ; otù nwa-oke-ehi, otù ebulu, umu-aturu asa nke b͕ara otú arọ; nke zuru okè ha gāburu unu: 9 na onyinye-inata-iru-ọma-ha, bú utu ọka flour agwara manu, uzọ atọ n'uzọ iri iji chu otù ebulu ahu, 10 otù uzọ n'uzọ iri, otú uzọ iri, iji chu nwa-aturu ọ bula nime umu-aturu asa ahu: 11 otù nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nmehie nkpuchi-nmehie, na àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha. 12 Ọzọ, n'ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa nke-asa nkpọkọta nsọ gādiri unu; ọ dighi ozi ọ bula nke òfufè unu gēje, unu gēme-kwa-ra Jehova ememe ubọchi asa: 13 unu gēweta kwa nso àjà-nsure-ọku, bú àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova; umu-oke-ehi iri na atọ, ebulu abua, umu-aturu iri na anọ nke b͕ara otù arọ; nke zuru okè ka ha gābu: 14 na onyinye-inata-iru-ọma-ha, utu ọka flour agwara manu, uzọ atọ n'uzọ iri iji chu oke-ehi ọ bula nime oke-ehi iri na atọ ahu, uzọ abua n'uzọ iri iji chu ebulu ọ bula nime ebulu abua ahu, 15 otù uzọ iri, otù uzọ n'uzọ iri, iji chu nwa-aturu ọ bula nime umu-aturu iri na anọ ahu: 16 na otù nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya. 17 N'ubọchi nke-abua unu gēweta kwa nso umu-oke-ehi iri na abua, ebulu abua, umu-aturu iri na anọ nke b͕ara otù arọ, nke zuru okè: 18 na onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha, iji chu oke-ehi iri na abua ahu, na iji chu ebulu abua ahu, na iji chu umu aturu ahu, n'ọnu-ọgugu-ha, dika ikpé ahu si di: 19 na otù nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha. 20 N'ubọchi nke-atọ kwa oke-ehi iri-na-otù, ebulu, umu-aturu iri na anọ nke b͕ara otù arọ, nke zuru okè; 21 na onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha, iji chu oke-ehi iri na otù ahu, na iji chu ebulu abua ahu, na iji chu umu-aturu ahu, n'ọnu-ọgugu-ha, dika ikpé ahu si di: 22 na otù nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inatu-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya. 23 N'ubọchi nke-anọ kwa oke-ehi iri, ebulu abua, umu-aturu iri na anọ nke b͕ara otù arọ, nke zuru okè: 24 na onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha iji chu oke-ehi iri ahu, na iji chu ebulu abua ahu, na iji chu umu-aturu ahu, n'ọnu-ọgugu-ha, dika ikpé ahu si di: 25 na otù nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya. 26 N'ubọchi nke-ise kwa oke-ehi iteghete, ebulu abua, umu-aturu iri na anọ nke b͕ara otú arọ, nke zuru okè; 27 na onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha iji chu oke-ehi iteghete ahu, na iji chu ebulu abua ahu, na iji chu umu-aturu ahu, n'ọnu-ọgugu-ha, dika ikpé ahu si di: 28 na otú nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya. 29 N'ubọchi nke-isi kwa oke-ehi asatọ, ebulu abua, umu-aturu iri na anọ nke b͕ara otù arọ zuru okè: 30 na onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha, iji chu oke-ehi asatọ ahu, na iji chu ebulu abua ahu, na iji chu umu-aturu ahu, n'ọnu-ọgugu-ha, dika ikpé ahu si di: 31 na otù nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya nile. 32 N'ubọchi nke-asa kwa oke-ehi asa, ebulu abua, umu-aturu iri na anọ nke b͕ara otù arọ, nke zuru okè: 33 na onyinye-inata-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha, iji chu oke-ehi asa ahu, na iji ebulu abua ahu, na iji chu umu-aturu ahu, n'ọnu-ọgugu-ha, dika ikpé ahu si di: 34 na otù nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya. 35 N'ubọchi nke-asatọ nb͕ochi gādiri unu: ọ dighi ozi ọ bula nke òfufè unu gēje: 36 ma unu gēweta nso àjà-nsure-ọku. bú àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova: ' otú oke-ehi, otú ebulu, umu-aturu asa nke b͕ara otù arọ, nke zuru okè: 37 onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-oṅuṅu nile ha, iji chu oke-ehi ahu, na iji chu ebulu ahu, na iji chu umu-aturu ahu, gādi n'ọnu-ọgugu-ha, dika ikpé ahu si di: 38 na otù nkpi iji chu aja-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya. 39 Ndia ka unu gēmere Jehova na mb͕e nile unu akara àkà, nāgughi nkwa nile unu, na onyinye-afọ-ofufo nile unu, iji chu àjà-nsure-ọku nile unu, na iji chu onyinye-inata-iru-ọma nile unu, na iji chu àjà-ihe-ọṅuṅu nile unu, na iji chu àjà-udo nile unu. 40 Moses we gwa umu Israel okwu dika ihe nile nke Jehova nyere Moses n'iwu si di.

Ọnu-Ọgugu 30

1 Moses we gwa ndi-isi nke ebo nile nke umu Israel okwu, si, Nka bu ihe nke Jehova nyeworo n'iwu. 2 Nwoke ọ bula, mb͕e ọ gēkwe Jehova nkwa, ma-ọbu mb͕e ọ gāṅu iyi iwere isọ-nsọ ke nkpuru-obi-ya ab͕u, ọ gaghi-eme ka okwu-ya ghara idi nsọ; dika ihe nile si di nke nēsi n'ọnu-ya puta, otú a ka ọ gēme. 3 Nwayi kwa, mb͕e ọ gēkwe Jehova nkwa, were kwa isọ-nsọ ke onwe-ya ab͕u, n'ulo nna-ya, mb͕e ọ di na nwata; 4 nna-ya we nu nkwa-ya, na isọ-nsọ-ya o ji ke nkpuru-obi-ya ab͕u, ma nna-ya b͕ara ya nkiti: nkwa-ya nile gēguzosi kwa ike, isọ-nsọ ọ bula nke o ji ke nkpuru-obi-ya ab͕u gēguzosi kwa ike. 5 Ma ọ buru na nna-ya si ya, É-è, n'ubọchi ọ nuru ya; ọ dighi ihe ọ bula nime nkwa-ya nile, ma-ọbu nime isọ-nsọ-ya nile nke o ji ke nkpuru-obi-ya ab͕u, gēguzosi ike: Jehova gab͕aghara kwa ya, n'ihi na nna-ya si ya, É-è. 6 Ma ọ buru na nwoke alua ya na nwunye ma-ọli, mb͕e nkwa-ya nile dikwasi ya, ma-ọbu okwu efu ahu nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya, nke o ji ke nkpuru-obi-ya ab͕u; 7 di-ya we nu ya, ma ọ b͕ara ya nkiti n'ubọchi ọ nuru ya: nkwa-ya nile gēguzosi kwa ike, isọ-nsọ nile, nke o ji ke nkpuru-obi-ya ab͕u, gēguzosi kwa ike. 8 Ma ọ buru na di-ya si ya, É-è, n'ubọchi ọ nuru ya; ọ gēmebi kwa nkwa-ya nke dikwasi ya, na okwu efu ahu nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya, nke o ji ke nkpuru-obi-ya: Jehova gāb͕aghara kwa ya. 9 Ma nkwa nke nwayi di-ya nwuru, ma-ọbu nke nwayi achupuru achupu, bú ihe ọ bula nke o ji ke nkpuru-obi-ya ab͕u, o gēguzosi ike megide ya. 10 Ma ọ buru na ọ bu n'ulo di-ya ka o kwere nkwa, ma-ọbu were isọ-nsọ ke nkpuru-obi-ya ab͕u n'iṅu-iyi, 11 di-ya we nu ya, ma ọ b͕ara ya nkiti, ọ sighi kwa ya, É-è; nkwa-ya nile gēguzosi kwa ike, isọ-nsọ ọ bula nke o ji ke nkpuru-obi-ya ab͕u gēguzosi kwa ike. 12 Ma ọ buru na di-ya emebisia ha n'ubọchi ọ nuru ha; ihe ọ bula nke nēsi n'eb͕ub͕ere-ọnu-ya puta bayere nkwa-ya nile, ma-ọbu nke bayere isọ-nsọ nke nkpuru-obi-ya, ọ gaghi-eguzosi ike: di-ya emebiwo ha; Jehova gāb͕aghara kwa ya. 13 Nkwa ọ bula, na iyi isọ-nsọ ọ bula iji weda nkpuru-obi n'ala, di-ya gēme ka o guzosi ike, ma-ọbu di-ya gēmebi ya. 14 Ma ọ buru na di-ya ab͕achie ya nkiti site n'ubọchi rue ubọchi: o mewo kwa nkwa-ya nile, ma-ọbu isọ-nsọ-ya nile, nke dikwasi ya, ka ha guzosie ike: o mewo ka ha guzosie ike, n'ihi na ọ b͕ara ya nkiti n'ubọchi ọ nuru ha. 15 Ma ọ buru na o mebisia ha mb͕e ọ nusiri ha; ọ gēbu kwa ajọ omume nwayi ahu. 16 Ndia bu ukpuru, nke Jehova nyere Moses n'iwu. n'etiti nwoke na nwunye-ya, n'etiti nna na nwa-ya nwayi, mb͕e ọ di na nwata n'ulo nna-ya.

Ọnu-Ọgugu 31

1 Jehova we gwa Moses okwu, si, 2 Bọrọ umu Israel ọ́bọ̀ n'aru ndi Mdian: emesia agāchikọta gi na umu-nna-gi n'ala-mọ. 3 Moses we gwa ndi Israel okwu, si, Sinu n'etiti onwe-unu jikere n'onwe-unu ndikom isoro usu-ndi-agha, ka ha we megide Midian, ibọkwasi Midian ọ́bọ̀ Jehova. 4 Nnù ndikom abua na ọgu iri n'ebo n'ebo, n'ebo nile nke Israel, ka unu gēzigara usu-ndi-gha ahu. 5 Ewe si n'usu nnù abua na ọgu iri nile nke Israel rara nnù ndikom abua na ọgu iri nke ebo ọ bula nye, orú nnù na nnù iri ejikere iso usu-ndi-agha ahu. 6 Moses we ziga ha, nnù ndikom abua na ọgu iri nke ebo ọ bula, isoro usu-ndi-agha, ha na Finehas nwa Eleeza, bú onye-nchu-àjà, isoro usu-ndi-agha, ihe nile nke ebe nsọ Chineke na opì abua ọ gāfù idasi uda ike di kwa n'aka-ya. 7 Ha we buso Midian agha, dika Jehova nyere Moses iwu; ha we b͕ue nwoke nile ọ bula. 8 Ndi-eze Midian ka ha b͕u-kwa-ra, tiyere ndi-ha eb͕uru eb͕u; bú Evi, na Rekem, na Zua, na Hua, na Reba, eze ise Midian: ha were kwa mma-agha b͕ue Belam nwa Beoa. 9 Umu Israel we dọta ndinyom Midian na umu-ntakiri-ha n'agha; ọ bu kwa anu-ulo-ha nile, na anumanu-ha nile, na àkù-ha nile, ka ha lutara n'agha. 10 Ha sure-kwa-ra obodo-ha nile n'ebe-obibi nile ha, na ebe-ulo-ikwū-ha nile, n'ọku. 11 Ha we chiri ihe nile akwatara n'agha, na ihe-nweta nile, ma n'etiti madu ma n'etiti anumanu. 12 Ha we wetara Moses, weta-kwa-ra Eleeza, bú onye-nchu-àjà, weta-kwa-ra nzukọ umu Israel, ndi adọtara n'agha, na ihe-nweta, na ihe akwatara n'agha, rue ọmuma-ulo-ikwū, rue ala ihe nādighi nke Moab nke di n'akuku Jọdan na nso Jeriko. 13 Moses, na Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na ndi-isi nile nke nzukọ Israel, we pua izute ha n'azu ọmuma-ulo-ikwū. 14 Moses we wesa ndi-nlekọta usu-ndi-agha ahu iwe, bú ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri na ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise, ndi nēsi n'usu-ndi-agha nke agha ahu bia. 15 Moss we si ha, Ùnu emewo ka ndinyom nile di ndu? 16 Le, ndia buru umu Israel, n'okwu-ọnu Belam, ihe nēweta nmekpu megide Jehova n'okwu Peoa, ihe-otiti ahu we di n'etiti nzukọ Jehova. 17 Ma ub͕u a b͕uenu nwoke ọ bula n'etiti umu-ntakiri, ọ bu kwa nwayi ọ bula nke mara nwoke site na ndina nwoke ka unu gēb͕u. 18 Ma umu-ntakiri nile n'etiti ndinyom, ndi nāmaghi ndina nwoke, menu ka ha diri unu ndu. 19 Ma unu onwe-unu, manu ulo-kwū-unu n'azu ọmuma-ulo-ikwū ubọchi asa: onye ọ bula nke b͕uworo madu, na onye ọ bula nke metuworo onye eb͕uru eb͕u aru, wepunu nmehie n'aru-unu n'ubọchi nke-atọ na n'ubọchi nke-asa, unu onwe-unu na ndi unu dọtaworo n'agha. 20 Ma uwe ọ bula, na ihe akpukpọ ọ bula, na ihe ọ bula eji aji ewu me, na ihe osisi ọ bula, unu gēwepu nmehie bayere ha n'aru-unu. 21 Eleeza, bú onye-nchu-àjà, we si ndikom nke usu-ndi-agha ahu ndi nābà n'agha ahu, Nka bu ukpuru iwu ahu nke Jehova nyere Moses n'iwu: 22 otú ọ di, ọla-edo, na ọla-ọcha, na ọla, na ígwè, na b͕amb͕am, na opù, 23 bú ihe ọ bula nke gānagide ọku, unu gēme ka ọ gabiga n'ọku ọ gādi kwa ọcha; nání, agēwere miri nke idi-na-nsọ wepu nmehie-ya: ma ihe ọ bula nke nāgaghi-anagide ọku, unu gēme ka ọ gabiga nime miri. 24 Unu gāsu kwa uwe-unu n'ubọchi nke-asa, unu gādi kwa ọcha, emesia unu gābata n'ọmuma-ulo-ikwū. 25 Jehova we gwa Moses okwu, si, 26 Guta ọnu-ọgugu ihe-nweta, bú nke adọtara n'agha, ma n'etiti madu ma n'etiti anu-ulo, gi onwe-gi, na Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na ndi-isi nke ndi bu nna nzukọ a: 27 kera ihe-nweta ahu; n'etiti ndi nēbu agha, bú ndi nāpukuru usu-ndi-agha, na nzukọm nile: 28 unu gānara kwa n'aka ndi-agha ahu, bú ndi nāpukuru usu-ndi-agha ahu, útù ibuliri Jehova: otù nkpuru-obi nime nnù nkpuru-obi na ọgu ise, nime madu, na nime ìgwè ehi, na nime inyinya-ibu, na nime ìgwè ewu na aturu; 29 na nkera-ha ka unu gānara ya, nye ya Eleeza, bú onye-nchu-àjà, ọ bu àjà-nbuli Jehova 30 Na nkera nke umu Israel ka i gānara kwa otù ihe anaputara n'ọgu ihe abua na iri, nime madu, na nime ìgwè ehi, na nime inyinya-ibu, na nime ìgwè ewu na aturu, bú nime anu-ulo nile, i gēnye kwa ha ndi Livai, bú ndi nēdebe ihe-ndebe nke ebe-obibi Jehova. 31 Moses na Eleeza, bú onye-nchu-àjà, we me dika Jehova nyere Moses iwu. 32 Ma ihe-nweta ahu, bú ihe fọduru n'ihe-nluta nke ndi usu-ndi agha lutara n'agha, bu orú nnù aturu ọgu uzọ anọ na uzọ anọ, na nnù asa, na ọgu iri, 33 ehi di kwa orú nnù uzọ iteghete; 34 inyinya-ibu di kwa orú nnù uzọ asa, na nnù iri-na-abua, na ọgu iri; 35 madu kwa, bú ndinyom ndi nāmaghi ndina nwoke, madu nile di orú nnù uzọ anọ. 36 Nkera ahu, nke bu òkè nke ndi nāpu ba n'usu-ndi-agha, we di n'ọnu-ọgugu ìgwè ewu na aturu orú nnù ọgu uzọ abua na uzọ abua, na nnù atọ, na ọgu iri-na-ise: 37 útù atùru Jehova, nke sitere n'ìgwè ewu na aturu, we di nnù na ọgu iri-na-atọ, na iri na ise. 38 Ehi di kwa orú nnù uzọ anọ na nnù iri; utu aturu Jehova site na ha we di ọgu atọ na iri na abua. 39 Inyinya-ibu di kwa orú nnù uzọ atọ, na nnù iri-na-isi, na ọgu ise; utu-ha aturu Jehova we di ọgu atọ na otù. 40 Madu di kwa orú nnù uzọ abua; utu aturu Jehova site na ha we di orú madu na iri na abua. 41 Moses we nye Eleeza, bú onye-nchu-àjà, utu ahu, nke bu àjà-nbuli Jehova, dika Jehova nyere Moses iwu. 42 Moses we nara na nkera nke umu Israel, nke Moses kerara site na ihe ndikom nēbu agha, 43 (ma nkera nke nzukọ Israel, nke sitere n'ìgwè ewu na aturu, di orú nnù ọgu uzọ abua na uzọ abua, na nnù atọ, na ọgu iri-na-ise, 44 ìgwè ehi di orú nnù uzọ anọ, na nnù iri, 45 inyinya-ibu di orú nnù uzọ atọ, na nnù iri-na-isi, na ọgu ise, 46 madu di orú nnù uzọ abua; ) 47 Moses we nara na nkera nke umu Israel otù ihe anaputara n'ọgu ihe abua na iri, nime madu, na nime anu-ulo, ọ we nye ha ndi Livai, bú ndi nēdebe ihe-ndebe nke ebe-obibi Jehova; dika Jehova nyere Moses iwu. 48 Ndi-nlekọta ndi nēlekọta usu nile nke nnù ndikom nke usu-ndi-agha abua na ọgu iri, bú ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri, na ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise, we bia nso Moses: 49 ha si Moses, Ndi-orù-gi agutawo ọnu-ọgugu ndi-agha nke di n'aka-ayi, ma ọ dighi otù nwoke puru na ngukọta-ayi. 50 Ayi ewetawo kwa nso ihe iji biaru nso Jehova, ihe nwoke ọ bula chọtaworo, ihe ọla-edo, bú iyab͕a-ukwu, na ọla-aka, na nb͕a-aka-akàrà, na nb͕a-aka-nti, na ihe anēyi n'olu, ikpuchiri nkpuru-obi-ayi nmehie-ha n'iru Jehova. 51 Moses na Eleeza, bú onye-nchu-àjà, we nara ha ọla-edo ahu, bú ihe nile akpuru akpu. 52 Ọla-edo nile nke àjà-nbuli ahu nke ha buliri Jehova we di orú nnù shekel uzọ abua, na nnù, na ọgu iri na asa, na iri, bú nke sitere n'aka ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri, na n'aka ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise. 53 (N'ihi na ndikom nke usu-ndi-agha ahu lutara ihe n'agha, nwoke ọ bula ọ lutara n'onwe-ya. ) 54 Moses na Eleeza, bú onye-nchu-àjà, we nara ọla-edo ahu n'aka ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri na nke usu nile nke ọgu ndikom ise, webata ha n'ulo-ikwū nzute, iburu umu Israel ihe-ncheta n'iru Jehova.

Ọnu-Ọgugu 32

1 Ma umu Reuben na umu Gad nwere ọtutu anu-ulo, ha riri nne nke-uku: ha we hu ala Jeza, na ala Gilead, ma, le, ebe ahu bu ebe anu-ulo; 2 umu Gad na umu Reuben we bia, gwa Moses, gwa kwa Eleeza, bú onye-nchu-àjà, gwa kwa ndi-isi nzukọ Israel, okwu, si, 3 Atarot, na Dibon, na Jeza, na Nimra, na Heshbon, na Eleale, na Seban, na Nebo, na Beon, 4 bú ala nke Jehova tib͕uru n'iru nzukọ Israel, ala anu-ulo ka ọ bu, ma ndi-orù-gi nwere anu-ulo. 5 Ha si kwa, Ọ buru na ayi ahutawo amara n'iru gi, ka enye ndi-orù-gi ala nka ibu ihe-onwunwe; emela ka ayi gabiga Jọdan. 6 Moses we si umu Gad na umu Reuben, Umu-nne-unu, hà gābà n'agha ahu, unu onwe-unu ewe nọdu n'ebe a? 7 Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka unu nēme ka obi umu Israel ju igabiga ba n'ala ahu Jehova nyeworo ha? 8 Otú a ka nna-unu-hà mere, mb͕e m'siri n'ala Kedesh-banea ziga ha ihu ala ahu. 9 Ha we rigorue ndagwurugwu Eshkol, hu ala ahu, we me ka obi umu Israel si, É-è, si na ha agaghi-abà n'ala ahu nke Jehova nyere ha-ri. 10 Iwe Jehova we di ọku n'ubọchi ahu, Ọ we ṅua iyi, si, 11 Ndikom ahu ndi nēsi n'ala Ijipt rigoputa, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, ha agaghi-ahu ala ahu ma-ọli nke M'ṅuru Abraham, ṅu-kwa-ra Aisak, ṅu-kwa-ra Jekob, iyi inye ha; n'ihi na ha esozughm n'azu: 12 ma ọ bu nání Keleb nwa Jefune, bú onye Kenizait, na Joshua nwa Nun: n'ihi na ha esozuwo Jehova n'azu. 13 Iwe Jehova we di ọku megide Israel, O we me ka ha nāṅaghari n'ọzara ọgu arọ abua, rue mb͕e ọb͕ọ ahu nile, nke nēme ihe ọjọ n'anya Jehova, gwusiri. 14 Ma, le, unu ebiliwo n'ọnọdu nna-unu-hà, nmuba nke ndikom, bú ndi-nmehie, iwere idi-ọku ọzọ tukwasi n'idi-ọku iwe Jehova megide Israel. 15 Mb͕e unu gēsi n'iso Ya n'azu laghachi, Ọ gārapu kwa ha n'ọzara nka; unu gēbibi kwa ndi nka nile. 16 Ha we biakute ya nso, si, Ogige ìgwé ewu na aturu ka ayi gēwuru anu-ulo-ayi n'ebe a, wu-kwa-ra umu-ntakiri-ayi obodo: 17 ma ayi onwe-ayi gējikere onwe-ayi je ọsọsọ n'iru umu Israel, rue mb͕e ayi gēme ka ha ba n'ebe-ha: ma umu-ntakiri-ayi gēbi n'obodo ndia ewusiri ike n'ihi ndi bi n'ala ahu. 18 Ayi agaghi-alata n'ulo-ayi, rue mb͕e umu Israel ketaworo, nwoke ọ bula ihe-nketa-ya. 19 N'ihi na ayi agaghi-esoro ha keta si n'ofè Jọdan we gaba n'iru, n'ihi na ihe-nketa-ayi abiaruwo ayi aka n'ofè Jọdan nka n'uzọ ọwuwa-anyanwu. 20 Moses we si ha, Ọ buru na unu eme ihe a; ọ buru na unu ejikere onwe-unu n'iru Jehova ibu agha, 21 ọ buru kwa na onye ọ bula nime unu nke ejikere agabiga Jọdan n'iru Jehova, rue mb͕e Ọ gānapu ndi-iro-Ya ala-ha n'iru Ya, 22 ewe buda ala ahu n'iru Jehova: emesi kwa unu gālata, we buru ndi ikpe nāmaghi site n'aka Jehova, site kwa n'aka Israel; ala nka ewe buru unu ihe-onwunwe n'iru Jehova. 23 Ma ọ buru na unu emeghi otú a, le, unu emehiewo megide Jehova: mara-kwa-nu nmehie-unu, na ọ gāchọputa unu. 24 Unu wuere onwe-unu obodo ufọdu ebe umu-ntakiri-unu gēbi, wu-kwa-ra ìgwé ewu na aturu-unu ogige; me-kwa-nu ihe nēsi n'ọnu-unu puta. 25 Umu Gad na umu Reuben we gwa Moses okwu, si, Ndi-orù-gi gēme dika onye-nwem nēnye iwu. 26 Umu-ntakiri-ayi, na ndinyom-ayi, na anumanu-ayi, na anu-ulo-ayi nile, gānọ n'ebe ahu n'obodo nile nke Gilead: 27 ma ndi-orù-gi gāgabiga, onye ọ bula nke ejikere iso usu-ndi-agha, n'iru Jehova ibu agha, dika onye-nwem nēkwu. 28 Moses we nye Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na Joshua nwa Nun, na ndi-isi nke ndi bu nna ebo nile nke umu Israel, iwu bayere ha. 29 Moses we si ha, Ọ buru na umu Gad na umu Reuben eso unu gabiga Jọdan, onye ọ bula nke ejikere ibu agha, n'iru Jehova, ewe buda ala ahu n'iru unu; unu gēnye kwa ha ala Gilead ahu, ibu ihe-onwunwe: 30 ma ọ buru na ha esoghi unu gabiga na njikere, ha gēketa kwa ala n'etiti unu n'ala Kenean. 31 Umu Gad umu Reuben we za, si, Okwu nke Jehova gwaworo ndi-orù-gi, otù a ka ayi gēme 32 Ayi onwe-ayi gāgabiga na njikere n'iru Jehova ba n'ala Kenean, ọ bu kwa n'aka-ayi ka ihe-onwunwe nke ihe-nketa-ayi gādi n'ofè Jọdan. 33 Moses we nye ha, bú umu Gad, na umu Reuben, na nkera ebo Manase nwa Josef, ala-eze Saihon, bú eze ndi-Amorait, na ala-eze Og, bú eze Beshan, ala ahu, dika obodo-ya nile si di n'ókè-ala nile ha, bú obodo nile nke ala ahu buruburu. 34 Umu Gad we wue Dibon, na Atarot, na Aroea; 35 na Atrot-shofan, na Jeza, na Jọgbeha; 36 na Bet-nimra, na Bet-haran: bú obodo ewusiri ike, na ogige ìgwè ewu na aturu. 37 Umu Reuben wu-kwa-ra Heshbon na Eleale, na Kiriataim; 38 na Nebo, na Beal-meon, (ma ab͕anwere aha-ha, ) na Sibma: ha we were aha kpọkwasi obodo ha wuru aha. 39 Umu Makia nwa Manase we je Gilead, were ya, napu ya n'aka ndi-Amorait ndi bi nime ya. 40 Moses we were Gilead nye Makia nwa Manase; ọ we biri nime ya. 41 Jaia nwa Manase we je were ebe-obibi nile ha, we kpọ ha Havot-jaia. 42 Noba we je were Kenat, na umu-obodo-ya, we kpọ Noba, n'aha nke ya.

Ọnu-Ọgugu 33

1 Ndia bu nbuli-ije umu Israel, ndi siri n'ala Ijipt puta, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di, n'aka Moses na Eron. 2 Moses we de ọpupu nile ha n'akwukwọ dika nbuli-ije nile ha si di, n'okwu-ọnu Jehova: ndia bu kwa nbuli-ije-ha dika ọpupu nile ha si di. 3 Ha we si na Rameses bulie ije n'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa mbu ahu; n'echi nke ngabiga ahu ka umu Israel siri n'Ijipt puta n'aka di elu n'anya ndi Ijipt nile, 4 mb͕e ndi Ijipt nēlì ndi Jehova tib͕uru n'etiti ha, bú ndi nile eburu uzọ mu: ọ bu kwa n'aru ndi bu chi-ha ka Jehova mere ihe nile O kpere n'ikpe. 5 Umu Israel we si na Rameses bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Sukot. 6 Ha si na Sukot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Itam, nke di n'usọ ọzara. 7 Ha si n'Itam bulie ije, jeghachi rue Pai-hahairot, nke di n'iru Beal-zefon: ha ma ulo-ikwū-ha n'iru Migdol. 8 Ha si n'iru Hahairot bulie ije, gabiga n'etiti oké osimiri ba n'ọzara: ha je ije nke ubọchi atọ n'ọzara Itam, ma ulo-ikwū-ha nime Mara. 9 Ha si na Mara bulie ije, biarue Ilim: isi-iyi miri iri na abua na ọgu nkwu atọ na iri di kwa n'Ilìm; ha we ma ulo-ikwū-ha n'ebe ahu. 10 Ha si n'Ilim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'akuku Oké Osimiri Uhie. 11 Ha si n'Oké Osimiri Uhie bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ọzara Sin. 12 Ha si n'ọzara Sin bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Dọfka. 13 Ha si na Dọfka bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Alush. 14 Ha si n'Alush bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Refidim, ebe ndi Israel nēnweghi miri iṅu. 15 Ha si na Refidim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ọzara Sainai. 16 Ha si n'ọzara Sainai bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Kibrot-hataava. 17 Ha si na Kibrot-hataava bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Hazerot. 18 Ha si na Hazerot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Ritma. 19 Ha si na Ritma bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Rimon-perez. 20 Ha si na Rimon-perez bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Libna. 21 Ha si na Libna bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Risa. 22 Ha si na Risa bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Kehilata. 23 Ha si na Kehilata bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ugwu Shefa. 24 Ha si n'ugwu Shefa bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Harada. 25 Ha si na Harada bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Makhilot. 26 Ha si na Makhilot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Tahat. 27 Ha si na Tahat bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Tera. 28 Ha si na Tera bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Mitka. 29 Ha si na Mitka bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Hashmona. 30 Ha si na Hashmona bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Mosirot. 31 Ha si na Mosirot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Beni-jaakan. 32 Ha si na Beni-jaakan bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Hoa-hagidgad. 33 Ha si na Hoa-hagidgad bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Jọtbata. 34 Ha si na Jọtbata bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Abrona. 35 Ha si n'Abrona bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Ezion-geba. 36 Ha si n'Ezion-geba bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ọzara Zin (nke ahu bu Kedesh). 37 Ha si na Kedesh bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ugwu Hoa, na nsọtu ala Edom. 38 Eron, bú onye-nchu-àjà, we rigo n'ugwu Hoa n'okwu ọnu Jehova, nwua n'ebe ahu, n'arọ nke-ọgu-abua site na mb͕e umu Israel siri n'ala Ijipt puta, n'ọnwa nke-ise, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu. 39 Eron we b͕a ọgu arọ isi na atọ mb͕e ọ nwuru n'ugwu Hoa. 40 Onye Kenean ahu, bú eze Arad, onye bi na Negeb n'ala Kenean, we nu na umu Israel abiawo. 41 Ha we si n'ugwu Hoa bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Zalmona. 42 Ha si na Zalmona bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Punon. 43 Ha si na Punon bulie, ije, ma ulo-ikwū-ha n'Obot. 44 Ha si n'Obot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Iye-abarim, n'ókè-ala Moab. 45 Ha si n'Iyim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Dibon-gad. 46 Ha si na Dibon-gad bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Almon-diblataim. 47 Ha si n'Almon-diblataim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ugwu Abarim, n'iru Nebo. 48 Ha si n'ugwu Abarim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ala ihe nādighi nke Moab, n'akuku Jọdan na nso Jeriko. 49 Ha ma ulo-ikwū-ha n'akuku Jọdan, site na Bet-jeshimot rue Ebel-shitim n'ala ihe nādighi nke Moab. 50 Jehova we gwa Moses okwu n'ala ihe nādighi nke Moab n'akuku Jọdan na nso Jeriko, si, 51 Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e unu onwe-unu nāgabiga Jọdan ba n'ala Kenean, 52 unu gānapu kwa n'aka ndi nile bi n'ala ahu ala-ha n'iru unu, unu gāla kwa nkume-ha nile nke emere ka ha yie ihe n'iyi, onyinyo-ha nile awuru awu ka unu gāla kwa n'iyì, me kwa ka ebe di elu nile tọb͕ọrọ n'efu. 53 Unu gēnweta kwa ala ahu, biri nime ya: n'ihi na ọ bu unu ka M'nyeworo ala ahu inweta ya. 54 Unu gēketa kwa ala ahu n'ife-nzà dika ab͕uru nile unu si di; ndi bara uba ka unu gēme ka ala-nketa-ha rie nne, ma ndi di ole-na-ole ka i gēme ka ala-nketa-ha di ntà: ebe ọ bula nzà ahu gāmara onye ọ bula, ọ gēnwe ya; dika ebo nile nke nna-unu-hà si di ka unu gēketa. 55 Ma ọ buru na unu anapughi n'aka ndi bi n'ala ahu ala-ha n'iru unu; ọ gēru kwa na ndi unu kwere ka ha fọdu site na ndi ahu gāghọ kwa obi-ogwu n'anya-unu, ghọ kwa ogwu n'akuku-unu, ha gākpab͕u kwa unu n'ala ahu nke unu onwe-unu nēbi nime ya. 56 O gēru kwa, na dika M'chère ime ha, otú a ka M'gēme unu.

Ọnu-Ọgugu 34

1 Jehova we gwa Moses okwu, si, 2 Nye umu Israel iwu, si ha, Mb͕e unu onwe-unu ganābata n'ala Kenean, (nka bu ala nke gēru unu aka n'ihe-nketa, bú ala Kenean dika ókè-ala-ya-nile si di, ) 3 akuku Ndida unu nwe-kwa-ra gēsite n'ọzara Zin n'akuku Edom, ókè-ala Ndida unu nwere gēsite kwa na nsọtu ahu nke Oké Osimiri Nnu nke chere iru n'Iru-anyanwu: 4 ókè-ala unu nwere gēsi kwa na Ndida b͕a buruburu rue nrigo Akrabim, ọ gāgabiga kwa rue Zin: ọpupu-ya nile gēsi kwa na Ndida Kedesh-banea; ọ gāpuru kwa Heza-ada, we gabiga rue Azmon: 5 ókè-ala ahu gēsi kwa n'Azmon b͕a buruburu rue miri-iyi Ijipt, ọpupu-ya nile gādiru kwa oké osimiri. 6 Ókè-ala ọdida-anyanwu kwa, unu gēnwe ọbuná oké osimiri uku ahu na ókè-ya: nka gāburu unu ókè-ala Ọdida-anyanwu 7 Nka gābu-kwa-ra unu ókè-ala Ugwu: unu gēsi n'oké osimiri uku ahu kpaputara onwe-unu ugwu Hoa: 8 unu gēsi n'ugwu Hoa kpaputarue nbata Hemat; ọpupu nile nke ókè-ala ahu gādiru kwa Zedad: 9 ókè-ala ahu gāputaru Zifron, ọpupu-ya nile gādiru kwa Heza-inan: nka gāburu unu ókè-ala Ugwu. 10 Unu gākpaputa-kwa-ra onwe-unu, ka ọ buru ókè-ala Iru-anyanwu, site na Heza-inan rue Shefam: 11 ókè-ala ahu gārida kwa site na Shefam rue Ribla, n'akuku Iru anyanwu Ain; ókè-ala ahu gārida kwa, we metu akuku oké osimiri Kineret nke chere iru n'Iru-anyanwu: 12 ókè-ala ahu gāridaru kwa Jọdan, ọpupu-ya nile gādiru kwa Oké Osimiri Nnu: nka gāburu unu ala, dika ókè-ala-ya nile si di buruburu. 13 Moses we nye umu Israel iwu, si, Nka bu ala ahu nke unu gēketa n'ife-nzà, nke Jehova nyere iwu bayere ya inye ebo iteghete ahu na nkera ebo ahu: 14 n'ihi na ebo umu ndi Reuben dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, na ebo umu ndi Gad dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, anarawo, nkera ebo Manase anarawo kwa, ihe-nketa-ha; 15 ebo abua ahu na nkera ebo ahu anarawo ihe-nketa-ha n'ofè Jọdan nka na nso Jeriko n'akuku Iru-anyanwu, n'uzọ ọwuwa-anyanwu. 16 Jehova we gwa Moses okwu, si, 17 Ndia bu aha ndikom ahu ndi gēme ka unu keta ala ahu: Eleeza, bú onye nchu-àjà, na Joshua nwa Nun. 18 Ọ bu kwa otù onye-isi otù onye-isi site n'ebo ọ bula ka unu gēkuru, ime ka eketa ala ahu. 19 Ndia bu aha ndikom ahu: nke ebo Juda, Keleb nwa Jefune. 20 Nke ebo umu Simeon, Shemuel nwa Amihud. 21 Nke ebo Benjamin, Elidad nwa Kislon. 22 Nke ebo umu Dan otù onye-isi kwa, bú Biku nwa Jọgli. 23 Nke umu Josef: nke ebo umu Manase otù onye-isi, bú Haniel nwa Ifod: 24 nke ebo umu Efraim otù onye-isi kwa, bú Kemuel nwa Shiftan. 25 Nke ebo umu Zebulun otù onye-isi kwa, bú Elizafan nwa Panak. 26 Nke ebo umu Isaka otù onye-isi kwa, bú Paltiel nwa Azan. 27 Nke ebo umu Asha otù onye-isi kwa, bú Ahihud nwa Shelomi. 28 Nke ebo umu Naftali otù onye-isi kwa, bú Padahel nwa Amihud. 29 Ndia bu ndi Jehova nyere iwu ime ka umu Israel Keta ala n'ala Kenean.

Ọnu-Ọgugu 35

1 Jehova we gwa Moses okwu n'ala ihe nādighi nke Moab n'akuku Jọdan na nso Jeriko, si, 2 Nye umu Israel iwu, ka ha si n'ihe-nketa nke ihe-onwunwe-ha nye ndi Livai obodo ibi nime ha; ebe-ita-nri nke obodo ahu gēnwe buruburu ha ka unu gēnye kwa ndi Livai. 3 Obodo ahu gābu-kwa-ra ha ebe ibi nime ha; ebe-ita-nri-ha gādi-kwa-ra anu-ulo-ha, di-kwa-ra àkù-ha, di-kwa-ra anu nile ha. 4 Ebe-ita-nri nke obodo nile, nke unu gēnye ndi Livai, gādi nnù cubit abua na ọgu iri site na mb͕idi obodo we gaba n'azu-ya buruburu. 5 Unu gātu kwa n'azu obodo akuku Iru anyanwu, nnù cubit ise, na akuku Ndida, nnù cubit ise, na akuku Ọdida-anyanwu, nnù cubit ise, na akuku Ugwu cubit ise, obodo gābi kwa n'etiti. Nka gāburu ha ebe-ita-nri nke obodo-ha. 6 Obodo nile nke unu gēnye ndi Livai, ha gābu obodo isi nke nb͕abà, nke unu gēnye ka ob͕u-madu we b͕alaga n'ebe ahu: unu genye kwa ọgu obodo abua na abua tiyere ha. 7 Obodo nile nke unu gēnye ndi Livai bu ọgu obodo abua na asatọ ha na ebe-ita-nri-ha. 8 Ma obodo nile ahu nke unu gēnye site n'ihe-onwunwe nke umu Israel, n'aka ndi bara uba ka unu gānara ọtutu obodo; ma n'aka ndi di ole-na-ole ka unu gānara obodo ole-na-ole: ọ bu dika ala-nketa-ya si di, nke ha nēketa, ka onye ọ bula gēnye ndi Livai site n'obodo-ya nile. 9 Jehova we gwa Moses okwu, si, 10 Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e unu onwe-unu ganāgabiga Jọdan ba n'ala Kenean, 11 unu gārọputa-kwa-ra onwe-unu obodo ufọdu, obodo nb͕aba ka ha gāburu unu; ka ob͕u-madu onye nētib͕u madu n'ọghọm we b͕alaga n'ebe ahu. 12 Obodo nile ahu gābu-kwa-ra unu ebe-nb͕abà agēsi n'aka onye-ọ́bọ̀ b͕alaga; ka ob͕u-madu we ghara inwu, rue mb͕e ọ gēguzo n'iru nzukọm ka ekpe ya ikpe. 13 Obodo ndia nke unu gēnye, obodo isi nke nb͕abá ka ha gāburu unu. 14 Obodo atọ ka unu gēnye n'ofè Jọdan nka, obodo atọ ka unu gēnye kwa n'ala Kenean; obodo nb͕abá ka ha gābu. 15 Obodo isi ndia gāburu umu Israel, buru kwa ọbìa, buru kwa onye bi n'etiti ha, ebe-nb͕abà: ka onye ọ bula nke nētib͕u madu n'ọghọm we b͕alaga n'ebe ahu. 16 Ma ọ buru na ọ were ihe ígwè tie ya, ọ we nwua, ob͕u-madu ka ọ bu: aghaghi ime ka ob͕u-madu ahu nwua. 17 Ọ buru kwa na o were nkume di ya n'aka, bú nke gēme ka madu nwua, tie ya, o we nwua, ob͕u-madu ka ọ bu: aghaghi ime ka ob͕u-madu ahu nwua. 18 Ma ọ buru na o were ihe osisi di ya n'aka, bú nke gēme ka madu nwua, tie ya, o we nwua, ob͕u-madu ka ọ bu: aghaghi ime ka ob͕u-madu ahu nwua. 19 Onye-ọ́bọ̀ ọbara, ya onwe-ya gēme ka ob͕u-madu ahu nwua: mb͕e o zutere ya, ya onwe-ya gēme ka ọ nwua. 20 Ọ buru kwa na ọ kwatue ya n'ikpọ-asì, ma-ọbu tua ya ihe, mb͕e o nēche anwu, o we nwua; 21 ma-ọbu asi na o were aka-ya tie ya n'iro, o we nwua; aghaghi ime ka onye nētib͕u ya nwua; ob͕u-madu ka ọ bu: onye-ọ́bọ̀, ọbara gēme ka ob͕u-madu ahu nwua, mb͕e o zutere ya. 22 Ma ọ buru na ọ bu na mberede ka ọ kwaturu ya, mb͕e ọ nādighi n'iro, ma-ọbu tua ya ihe ọ bula, mb͕e ọ nēcheghi anwu, 23 ma-ọbu asi na o were nkume ọ bula, bú nke gēme ka madu nwua, me ka ọ dakwasi ya, mb͕e ọ nāhughi ya, o we nwua, ma onye ahu abughi onye-iro-ya, ọ bughi kwa onye nāchọ ime ya ihe ọjọ: 24 nzukọm gēkpe kwa n'etiti oti-ihe ahu na onye-ọ́bọ̀ ọbara dika ikpé ndia si di: 25 nzukọm gānaputa kwa ob͕u-madu ahu n'aka onye-ọ́bọ̀ ọbara, nzukọm gēme kwa ka ọ laghachi n'obodo nb͕abà ya, ebe ọ b͕alagara: o gēbi kwa nime ya rue mb͕e ọnwu onye-isi-nchu-àjà, nke ewere manu nsọ ahu te. 26 Ma ọ buru na ob͕u-madu ahu esi n'ókè-ala obodo nb͕abà ya pua ma-ọli, bú ebe ọ b͕alagara; 27 onye-ọ́bọ̀ ọbara ewe huta ya n'azu ókè-ala abodo nb͕abà ya, onye-ọ́bọ̀ ọbara ahu we b͕ue ob͕u-madu ahu, ọ dighi ikpe ọbara mara ya: 28 n'ihi na nime obodo nb͕abà ya ka o gēbi rue mb͕e ọnwu onye-isi-nchu-àjà: ma mb͕e ọnwu onye-isi-nchu-àjà gasiri ob͕u-madu ahu gālaghachi n'ala ihe-onwunwe-ya. 29 Ihe ndia gābu-kwa-ra unu ukpuru ikpé rue ọb͕ọ nile unu n'ebe-obibi-unu nile. 30 Onye ọ bula nke nētib͕u madu, n'ọnu ndi-àmà ka agēb͕u ob͕u-madu ahu: ma nání otù onye-àmà agaghi-ab͕agide madu àmà ka ọ nwua. 31 Unu anara-kwa-la ihe-nb͕aputa n'ọnọdu ndu ob͕u-madu, nke ikpe inwu ọnwu maworo: ma aghaghi ime ka ọ nwua. 32 Unu anara-kwa-la ihe nb͕aputa n'ọnọdu onye b͕alagaworo n'obodo nb͕abà ya, ka ọ we lata ibi n'ala-ya, rue mb͕e ọnwu onye-nchu-àjà. 33 Unu emeru-kwa-la ala ahu nke unu onwe-unu bi nime ya: n'ihi na ọbara, nke ahu nēmeru ala: ma ala, agaghi-ekpuchiri ya nmehie-ya bayere ọbara awusiri nime ya, ma-ọbughi nání n'ọbara nke onye wusiri ya. 34 Eme-kwa-la ka ala ahu, nke unu onwe-unu nēbi nime ya, rua árú, nke Mu onwem nēbi n'etiti ya: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova, nēbi n'etiti umu Israel.

Ọnu-Ọgugu 36

1 Ndi-isi nke ndi bu nna nke ab͕uru umu Gilead, nwa Makia, nwa Manase, n'etiti ab͕uru umu Josef, we biarue nso, kwue okwu n'iru Moses, na n'iru ndi-isi, bú ndi-isi nke ndi bu nna nke umu Israel: 2 ha we si, Jehova nyere onye-nwem iwu inye umu Israel ala ahu n'ihe-nketa n'ife-nzà: enye-kwa-ra onye-nwem iwu n'ọnu Jehova iwere ihe-nketa Zelọfehad, bú nwa-nne-ayi, nye umu-ya ndinyom. 3 Ma asi na ha gāghọrọ nwoke ọ bula nke sitere n'umu ebo ọzọ nke umu Israel nwunye, agāgupu kwa ihe-nketa-ha n'ihe-nketa nke nna-ayi-hà, tukwasi ya n'ihe-nketa ebo ahu nke gēnwe ha: ewe gupu ya n'ihe ife-nzà nke ihe-nketa-ayi. 4 Ọ buru kwa na ọ bu jubile nke umu Israel, agātukwasi kwa ihe-nketa-ha n'ihe-nketa nke ebo ahu nke gēnwe ha: ewe gupu ihe-nketa-ha n'ihe-nketa ebo nna-ayi-hà. 5 Moses we nye umu Israel iwu n'okwu-ọnu Jehova, si, Ihe ziri ezi ka ebo umu Josef nēkwu. 6 Nka bu ihe Jehova nyeworo n'iwu bayere umu-ndinyom Zelọfehad, si, Nwoke di nma n'anya-ha ka ha gāburu nwunye; nání ọ bu ab͕uru nke ebo nke ndi bu nna-ha ka ha gāburu nwunye. 7 Ọ dighi kwa ihe-nketa umu Israel nwere gēsi n'ebo fe n'ebo ọzọ buruburu: n'ihi na umu Israel gārapara, nwoke ọ bula n'ihe-nketa ebo nna-ya-hà. 8 Nwa-nwayi nwoke ọ bula, nke nēnweta ihe-nketa n'ebo nile nke umu Israel, gāburu otù nwoke sitere n'ab͕uru nke ebo nna-ya nwunye, ka umu Israel we nweta, nwoke ọ bula ihe-nketa nna-ya-hà. 9 Ọ dighi kwa ihe-nketa gēsi n'ebo fe n'ebo ọzọ buruburu; n'ihi na ebo nile nke umu Israel gārapara, nwoke ọ bula n'ihe-nketa nke aka ya. 10 Dika Jehova nyere Moses iwu, otú a ka umu-ndinyom Zelọfehad mere: 11 Mahla, na Tiaza, na Họgla, na Milka, na Noa, bú umu-ndinyom Zelọfehad, we buru nwunye umu umu-nne nna-ha. 12 Ọ bu ndikom nke sitere n'ab͕uru umu Manase nwa Josef ka ha buru nwunye, ihe-nketa-ha we digide n'ebo nke ab͕uru nna-ha. 13 Ndia bu ihe enyere n'iwu, na ikpé, nke Jehova nyere umu Israel n'iwu n'aka Moses n'ala ihe nādighi nke Moab n'akuku Jọdan na nso Jeriko.

Deuteronomi 1

1 Ndia bu okwu ahu nke Moses gwara Israel nile n'ofè Jọdan n'ọzara, n'Araba ahu na ncherita-iru Suf, n'etiti Peran, na Tofel, na Leban, na Hazerot, na Di-zahab. 2 Ọ bu ubọchi iri na otù site na Horeb rue Kedesh-banea ma i si n'uzọ ugwu Sia. 3 O rue, n'arọ nke-ọgu-abua, n'onwa nke-iri-na-otù, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, na Moses gwara umu Israel okwu, dika ihe nile Jehova nyere ya n'iwu inye ha si di; 4 mb͕e o tib͕usiri Saihon, bú eze ndi-Amorait, nke bi na Heshbon, na Og, bú eze Beshan, nke bi n'Ashtarot, n'Edrei: 5 n'ofè Jọdan, n'ala Moab, ka Moses jisiri ike ikpọputa isi iwu a, si, 6 Jehova, bú Chineke-ayi, gwara ayi okwu na Horeb, si, O zuworo unu ibi n'ugwu a: 7 chenu iru, bulie ije, ba n'ugwu ndi-Amorait, ru kwa ab͕ata-ya nile, n'Araba, na n'ugwu, na n'ebe di ala ala, na nime Negeb, na n'ọnu-miri nke oké osimiri, bú ala nke ndi Kenean, na Lebanon, rue Osimiri uku ahu, bú osimiri Yufretis. 8 Le, edowom ala ahu n'iru unu: banu, nweta ala ahu nke Jehova ṅuru nna-unu-hà iyi, bú Abraham na Aisak na Jekob, inye ha, inye kwa nkpuru-ha gānọchi ha. 9 M'we gwa unu okwu na mb͕e ahu, si, Apughm ibū unu náním: 10 Jehova, bú Chineke-unu, emewo ka unu ba uba, ma, le, unu di ka kpakpando elu-igwe n'uba, ta. 11 Jehova, bú Chineke nna-unu-hà, tukwasi unu madu kari ka unu ra nnù uzọ abua na ọgu uzọ iri, gọzi kwa unu, dika Ọ gwara unu! 12 M'gēsi aṅa, náním, bū ike-ọgwugwu-unu, na ibu-unu, na ise-okwu-unu? 13 Doro onwe-unu ndikom mara ihe, ndi nwe-kwa-ra nghọta, ndi ama-kwa-ra aha-ha, dika ebo nile unu si di, m'gēdo kwa ha ndi-isi-unu. 14 Unu we zam, si, Ihe nke i kwuworo di nma ime. 15 M'we chiri ndi-isi ebo nile unu, ndikom mara ihe, ndi ama-kwa-ra aha-ha, m'we do ha ndi-isi-unu, ndi-isi nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri, na ndi-isi ọgu ise ọgu ise, na ndi-isi ọgu abua na iri ọgu abua na iri, na ndi-isi madu iri madu iri, na ndi-odozi-okwu, dika ebo nile unu si di. 16 M'we nye ndi-ikpe-unu iwu na mb͕e ahu, si, Nānunu ikpé n'etiti umu-nne-unu, nēkpe-kwa-nu ikpe ezi omume n'etiti nwoke na nwa-nne-ya na ọbìa-ya. 17 Unu amatala iru madu n'ikpé; unu gānu ikpé onye ntà na ikpé onye uku n'otù uzọ ahu; unu atula iru madu ujọ; n'ihi na ikpé ahu, ọ bu Chineke nwe ya: ma okwu nke sikari unu ike, unu gēweta ya nsom, m'gānu kwa ya. 18 M'we nye unu n'iwu na mb͕e ahu ihe nile unu gēme. 19 Ayi we si na Horeb bulie ije, we je ije nime ọzara uku ahu di egwu nke unu huru, n'uzọ ugwu ndi-Amorait, dika Jehova, bú Chineke-ayi, nyere ayi iwu; ayi we biarue Kedesh-banea. 20 M'we si unu, Unu abiaruwo ugwu ndi-Amorait, nke Jehova, bú Chineke-ayi, nēnye ayi. 21 Le, Jehova, bú Chineke-gi, edowo ala ahu n'iru gi: rigo, nweta, dika Jehova, bú Chineke nna-gi-hà, gwaworo gi okwu; atula egwu, atu-kwa-la ujọ. 22 Unu we biaruem nso, unu nile, si, Ka ayi zìe ndikom n'iru ayi, ka ha we leputara ayi ala ahu, weghachi-kwa-ra ayi okwu bayere uzọ nke ayi gēsi rigo, na obodo nke ayi gābà nime ha. 23 Okwu ahu we di nma n'anyam: m'we si n'etiti unu chiri ndikom iri na abua, otù nwoke diri otù ebo: 24 ha we che iru, rigo n'ugwu ahu, biarue ndagwurugwu Eshkol, we ledo ya. 25 Ha we were ufọdu nime nkpuru ala ahu n'aka-ha, wedatara ayi ya, weghachiri ayi okwu, si, Ọ di nma, bú ala nke Jehova, bú Chineke-ayi, nēnye ayi. 26 Ma unu achọghi irigo, kama unu nupuru isi n'okwu-ọnu Jehova, bú Chineke-unu: 27 unu we tamu ntamu n'ulo-ikwū-unu, si, N'asì nke Jehova kpọrọ ayi ka O mere ka ayi si n'ala Ijipt puta, inye ayi n'aka ndi-Amorait, ikpochapu ayi. 28 Òle ebe ayi onwe-ayi nārigo? umu-nne-ayi emewo ka obi-ayi ghara idi ike, si, Ọ bu ndi di uku di kwa ogologo kari ayi, na obodo uku ewusiri ike rue elu-igwe; ọzọ kwa, umu Anakim ka ayi huru n'ebe ahu. 29 M'we si unu, Unu amala jijiji, unu atu-kwa-la egwu ha. 30 Jehova, bú Chineke-unu, Onye nēje n'iru unu, Ya onwe-ya gēburu unu agha, dika ihe nile si di nke O mere bayere unu n'Ijipt n'anya-unu; 31 na n'ọzara, ebe i huworo na Jehova, bú Chineke-gi, kuru gi, dika nwoke si eku nwa-ya nwoke, n'uzọ ahu nile nke unu jere, rue mb͕e unu biaruru ebe a. 32 Ma n'okwu nka unu ekweghi na Jehova, bú Chineke-unu, 33 Onye nēje n'iru unu n'uzọ ahu, ileputara unu ebe ima ulo-ikwū-unu, n'ọku n'abali, ime ka unu hu uzọ nke unu gēje nime ya, na n'igwé-oji ahu n'ehihie. 34 Jehova we nu olu okwu nile unu, O we we iwe, ṅua iyi, si, 35 Ọ dighi otù nwoke nime ndikom ndia nke ọb͕ọ ọjọ nka gāhu ezi ala ahu ma-ọli, bú ala nke M'ṅuru nna-unu-hà iyi inye ha, 36 ma ọ bu nání Keleb nwa Jefune, ya onwe-ya gāhu ya; ọ bu ya ka M'gēnye ala ahu nke ọ zọkwasiri ukwu, M'gēnye kwa umu-ya: n'ihi na o sozuwo Jehova n'azu 37 Ọ bu kwa mu ka Jehova wesara iwe n'ihi unu, si, Gi onwe-gi kwa, i gaghi-abà n'ebe ahu: 38 Joshua nwa Nun, nke nēguzo n'iru gi, ya onwe-ya gābà n'ebe ahu: gi me ya ka ọ di ike; n'ihi na ya onwe-ya gēme ka Israel keta ya. 39 Ma umu-ntakiri-unu, ndi unu siri na ha gāghọ ihe alutara n'agha, na umu-unu ndikom, ndi nāmaghi ezi ihe na ihe ọjọ ta, ndi ahu gābà n'ebe ahu, ha ka M'gēnye kwa ya, ha onwe-ha gēnweta kwa ya. 40 Ma unu onwe-unu, chenu iru, bulie ije, ba n'ọzara n'uzọ Oké Osimiri Uhie. 41 Unu we za, sim, Ayi emehiewo megide Jehova, ayi onwe-ayi gārigo, bū agha, dika ihe nile si di nke Jehova, bú Chineke-ayi, nyere ayi n'iwu. Unu we ke, nwoke ọ bula ihe-agha-ya, we kpọ ya ihe nfe irigo n'ugwu ahu. 42 Jehova we sim, Si ha, Unu arigola, unu ebu-kwa-la agha; n'ihi na Mu anọghi n'etiti unu; ka aghara itib͕u unu n'iru ndi-iro-unu. 43 M'we gwa unu okwu, ma unu anughi; ma unu nupuru isi n'okwu-ọnu Jehova, we were nganga rigorue ugwu ahu. 44 Ndi-Amorait, ndi bi n'ugwu ahu, we puta izute unu, ha we chua unu, dika anwu si eme, we zọpia unu nime Sia, rue Họma. 45 Unu we laghachi, kwa ákwá n'iru Jehova; ma Jehova egeghi nti n'olu-unu, Ọ ṅaghi kwa unu nti. 46 Unu we biri na Kedesh ọtutu ubọchi, dika ubọchi nile si di nke unu biri n'ebe ahu.

Deuteronomi 2

1 Ayi we che iru, bulie ije ba n'ọzara n'uzọ Oké Osimiri Uhie, dika Jehova gwaram okwu: ayi we je ugwu Sia buruburu ọtutu ubọchi. 2 Jehova we gwam okwu, si, 3 O zuworo unu, bú ije ugwu a buruburu: chenu iru n'Ugwu n'onwe-unu. 4 Gi nye kwa ndim iwu, si, Unu onwe-unu nāgabiga n'ókè-ala umu-nne-unu, bú umu Isọ, ndi bi na Sia; ha gātu kwa egwu unu: ma unu gēlezi onwe-unu anya nke-uku: 5 unu alusola ha ọ̀gù; n'ihi na M'gaghi-enye unu ala sitere n'ala-ha, ọbuná rue ebe nzọkwasi ọbu-ukwu-unu: n'ihi na ọ bu Isọ ka M'nyeworo ugwu Sia, ka ọ buru ihe-nnweta. 6 Unu gēwere ego zuru ihe-oriri n'aka-ha, ka unu we rie; ọzọ kwa, unu gēwere ego zuru miri n'aka-ha, ka unu we ṅua. 7 N'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, agọziwo gi n'omume aka-gi nile: Ọ mawo ije-ije-gi n'ọzara uku a: ọgu arọ abua ndia ka Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi; ọ dighi ihe kọrọ gi. 8 Ayi we si n'ala umu-nne-ayi, bú umu Isọ, ndi bi na Sia, gabiga, site n'uzọ Araba, site n'Ilat, site kwa n'Ezion-geba. Ayi we che iru, gabiga n'uzọ ọzara Moab. 9 Jehova we sim, Akpab͕ula Moab, aluso-kwa-la ha ọ̀gù n'agha: n'ihi na M'gaghi-enye gi ala sitere n'ala-ya ibu ihe-nnweta; n'ihi na umu Lot ka M'nyeworo ya ka ọ buru ihe-nnweta. 10 (Imim biri nime ya na mb͕e gara aga, ndi di uku, di kwa ọtutu, di kwa ogologo, dika ndi Anak; 11 Refaim ka anāgu kwa ndia, dika ndi Anak; ma ndi Moab nākpọ ha Imim. 12 Ọ bu kwa na Sia ka ndi Hoa bi na mb͕e gara aga, ma umu Isọ napuru ha ala-ha; ha we kpochapu ha n'iru ha, bichie n'ọnọdu ha; dika umu Israel mere ala nke ihe-nnweta-ya, nke Jehova nyere ha. ) 13 Ub͕u a, bilienu, gabiga miri-iyi Zered n'onwe-unu. Ayi we gabiga miri-iyi Zered. 14 Ubọchi nile nke ayi siri na Kedesh-banea je ije, rue mb͕e ayi gabigara miri-iyi Zered, di orú arọ na iri na asatọ; rue mb͕e ọb͕ọ nile nke ndikom agha si n'etiti ọmuma-ulo-ikwū gwusia, dika Jehova ṅuru ha iyi. 15 Ọzọ kwa, aka Jehova digidere ha, ikpochapu ha n'etiti ọmuma-ulo-ikwū, rue mb͕e emere ka ha gwusia. 16 Ọ we rue, mb͕e ndikom agha ahu nile nwupusiri n'etiti ndi Israel, 17 na Jehova gwaram okwu, si, 18 Gi onwe-gi nāgabiga ya, bu ókè-ala Moab, ta: 19 ma mb͕e i nābiaru nso ncherita-iru umu Amon, akpab͕ula ha, aluso-kwa-la ha ọ̀gù: n'ihi na M'gaghi-enye gi ala sitere n'ala umu Amon ka ọ buru ihe-nnweta: n'ihi na umu Lot ka M'nyeworo ya ibu ihe-nnweta. 20 (Ala Refaim ka agu-kwa-ra nke ahu: Refaim biri nime ya na mb͕e gara aga; ma ndi Amon nākpọ ha Zamzumim; 21 ndi di uku, di kwa ọtutu, di kwa ogologo, dika ndi Anak; ma Jehova kpochapuru ha n'iru ha; ha we napu ha ala-ha, bichie n'ọnọdu ha: 22 dika ihe O mere nye umu Isọ, ndi bi na Sia, mb͕e o kpochapuru ndi Hoa n'iru ha; ha we napu ha ala-ha, bichie n'ọnọdu ha rue ta: 23 ma Avim ndi bi n'obodo ntà rue Geza, Kaftorim, ndi si na Kaftoa puta, kpochapuru ha, bichie n'ọnọdu ha. ) 24 Bilienu, bulie ije, gabiga ndagwurugwu Anon: le, enyewom Saihon onye-Amorait, bú eze Heshbon, na ala-ya, n'aka-gi: malite inweta ya, luso kwa ya ọ̀gù n'agha: 25 Ta ka M'gāmalite itiyekwasi ujọ-gi na egwu-gi n'iru ndi nile n'okpuru elu-igwe nile, ndi gānu akukọ-gi, ma kwa jijiji, ọ gēb͕u kwa ha nb͕u n'ihi unu. 26 M'we si n'ọzara Kedimot zigara Saihon, bú eze Heshbon, ndi-ozi izì okwu udo, si, 27 Ka m'gabiga n'ala-gi: n'uzọ n'uzọ ka m'ganēje, m'gaghi-ewezuga onwem n'aka-nri, ma-ọbu n'aka-ekpe. 28 N'ego ka i gērenyem ihe-oriri, ka m'we rie; n'ego ka i gēnyekwam miri, ka m'we ṅua: nání kwe ka m'gabiga n'ukwum; 29 dika umu Isọ ndi bi na Sia, na ndi Moab ndi bi na ya merem; rue mb͕e m'gāgabiga Jọdan, ba n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-ayi, nēnye ayi. 30 Ma Saihon, bú eze Heshbon, achọghi ka ayi gabiga n'ala-ya: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, mere mọ-ya ka ọ di ike, b͕a kwa obi-ya ume, ka O we nye ya n'aka-gi, otú ọ di ta. 31 Jehova we sim, Le, amalitewom irara Saihon na ala-ya nye n'iru gi: malite inweta, ka i we nweta ala-ya. 32 Saihon we puta izute ayi, ya onwe-ya na ndi-ya nile, ibu agha, rue Jehaz. 33 Jehova, bú Chineke-ayi, we rara ya nye n'iru ayi, ayi we tib͕ue ya, na umu-ya ndikom, na ndi-ya nile. 34 Ayi we were obodo-ya nile na mb͕e ahu, wezuga obodo ndikom ọ bula, ya na ndinyom na umu-ntakiri, ka ebibie ha; ọ dighi onye fọduru ayi rapuru: 35 nání anu-ulo ka ayi lutara n'agha n'onwe-ayi, ha na ihe-nkwata obodo nile nke ayi were. 36 Site n'Aroea, nke di n'usọ ndagwurugwu Anon, na obodo ahu nke di na ndagwurugwu ahu, we rue Gilead, ọ dighi obodo nke kariri ayi elu: ihe nile ka Jehova, bú Chineke-ayi, rara nye n'iru ayi: 37 nání, i biarughi nso ala umu Amon; akuku nile nke miri-iyi Jabok, na obodo nile nke ugwu, na ebe ọ bula Jehova, bú Chineke-ayi, nyere ayi iwu bayere ya.

Deuteronomi 3

1 Ayi we che iru, rigo n'uzọ Beshan: Og, bú eze Beshan, we puta izute ayi, ya onwe-ya na ndi-ya nile, ibu agha, rue Edrei. 2 Jehova we sim, Atula egwu ya: n'ihi na n'aka-gi ka M'nyeworo ya, na ndi-ya nile, na ala-ya; i gēme kwa ya dika i mere Saihon, bú eze ndi-Amorait, onye bi na Heshbon. 3 Jehova, bú Chineke-ayi, we nye kwa n'aka-ayi Og, bú eze Beshan, na ndi-ya nile: ayi we tib͕ue ya rue mb͕e ọ nādighi otù onye fọduru arapuru ya. 4 Ayi we were obodo-ya nile na mb͕e ahu; ọ dighi obodo ayi nānaraghi n'aka-ha; ọgu obodo atọ, akuku Agob nile, bú ala-eze Og nime Beshan. 5 Ndia nile bu obodo eji mb͕idi di elu, na ọnu-uzọ-ama, na nkpọrọ, wusi ike; nāgughi obodo nēnweghi mb͕idi, ha bara uba nke-uku. 6 Ayi we wezuga ha ka ebibie ha, dika ayi mere Saihon, bú eze Heshbon, nēwezuga obodo, ndikom ọ bula, ya na ndinyom, na umu-ntakiri, ka ebibie ya. 7 Ma anu-ulo nile, na ihe-nkwata nke obodo ahu nile, ayi lutara ha n'agha n'onwe-ayi. 8 Na mb͕e ahu ka ayi nara ala ahu n'aka eze abua nke ndi-Amorait ndi bi n'ofè Jọdan, site na ndagwurugwu Anon rue ugwu Heamon: 9 (ndi Saidon nākpọ Heamon ahu Sirion, ma ndi-Amorait nākpọ ya Senia; ) 10 bú obodo nile nke ala ahu di lari, na Gilead nile, na Beshan nile, rue Saleka na Edrei, bú obodo ala-eze Og nime Beshan. 11 (N'ihi na nání Og, bú eze Beshan, ka arapuru site na ndi fọduru nke Refaim; le, ihe-ndina-ya bu ihe-ndina ígwè; ihe-ndina ahu, ọ̀ dighi na Raba nke umu Amon? cubit iteghete ka ogologo-ya di, cubit anọ ka obosara-ya di kwa, dika cubit nke nwoke si di. ) 12 Ala nka ka ayi nweta-kwa-ra mb͕e ahu: site n'Aroea, nke di n'akuku ndagwurugwu Anon, na nkera ugwu Gilead, na obodo nile ya, ka m'nyere ndi Reuben nye kwa ndi Gad: 13 nke fọduru nime Gilead, na Beshan nile, bú ala-eze Og, ka m'nyere nkera ebo Manase; akuku Agob nile (Beshan ahu nile ka anākpọ ala Refaim. 14 Jaia nwa Manase were akuku Agob nile, rue ókè-ala ndi Geshua na ndi Meakat; ọ we kpọ ha Beshan-havot-jaia, n'aha-ya, rue ta. ) 15 Ọ bu kwa Makia ka m'nyere Gilead. 16 M'we nye ndi Reuben nye kwa ndi Gad site na Gilead we rue ndagwurugwu Anon, bú etiti ndagwurugwu ahu, ka ọ buru ókè-ala; we rue miri-iyi Jabok, bú ókè-ala umu Amon; 17 na Araba, na Jọdan, ka ọ buru ókè-ala, site na Kineret we rue oké osimiri Araba, bú Oké Osimiri Nnú, n'okpuru nkpọrube Pisga, n'akuku ọwuwa-anyanwu. 18 M'we nye unu iwu na mb͕e ahu, si, Jehova, bú Chineke-unu, enyewo unu ala nka inweta ya: na njikere-agha ka unu gāgabiga n'iru umu-nne-unu, bú umu Israel, unu ndi-dìnkpà nile. 19 Ọ bu nání na ndinyom-unu, na umu-ntakiri-unu, na anu-ulo-unu, (amawom na unu nwere ọtutu anu-ulo, ) gānọdu n'obodo-unu nke m'nyeworo unu; 20 rue mb͕e Jehova gēme ka umu-nne-unu zuru ike, dika O mere unu, ha onwe-ha we nweta kwa ala ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, nēnye ha n'ofè Jọdan: unu we laghachi, nwoke ọ bula rue ihe-nnweta-ya, nke m'nyeworo unu. 21 Joshua ka m'nye-kwa-ra iwu na mb͕e ahu, si, Anya-gi abua nāhu ihe nile Jehova, bú Chineke-unu, meworo eze abua ndia: otú a ka Jehova gēme ala-eze nile ebe gi onwe-gi nāgabiga. 22 Unu atula egwu ha: n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, Ya onwe-ya bu onye nēburu unu agha. 23 M'we riọ Jehova amara na mb͕e ahu, si, 24 Onye-nwe-ayi, Jehova, Gi onwe-gi amalitewo ime ka orù-Gi hu idi-uku-Gi, na aka-Gi di ike: n'ihi na òle chi di n'elu-igwe ma-ọbu n'uwa, nke nēme dika omume-Gi nile si di, na dika idi-ike-Gi nile si di? 25 Biko, ka m'gabiga, hu ezi ala ahu nke di n'ofè Jọdan, ezi ugwu ahu, na Lebanon. 26 Ma Jehova webigara iwe ókè n'arum n'ihi unu, O geghi-kwam nti: Jehova we sim, O zuwo gi; agwa-kwa-lam okwu bayere ihe a ọzọ ma-ọli. 27 Rigo n'elu Pisga, welie anya-gi abua le akuku Ọdida-anyanwu, na akuku Ugwu na akuku Ndida, na akuku ọwuwa-anyanwu, were kwa anya-gi abua le: n'ihi na i gaghi-agabiga Jọdan nka. 28 Nye kwa Joshua iwu, me kwa ya ka ọ di ike, b͕a kwa ya ume: n'ihi na ya onwe-ya gāgabiga n'iru ndi nka, ya onwe-ya gēme kwa ka ha keta ala ahu nke i nāhu. 29 Ayi we nọdu na ndagwurugwu na ncherita-iru Bet-peoa.

Deuteronomi 4

1 Ma ub͕u a, Israel, ge nti ukpuru nile, ge kwa nti ikpé nile, nke mu onwem nēzí unu, ime ha; ka unu we di ndu, we ba, nweta kwa ala ahu nke Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, nēnye unu. 2 Unu atukwasila ihe n'okwu ahu nke mu onwem nēnye unu n'iwu, unu agubì-kwa la ihe nime ya, idebe ihe nile Jehova, bú Chineke-unu, nyere n'iwu, bú nke mu onwem nēnye unu n'iwu. 3 Anya-unu nāhu ihe ahu nke Jehova mere n'okwu Beal-peoa: n'ihi na nwoke ọ bula nke jesoro Beal-peoa, Jehova, bú Chineke-gi, ekpochapuwo ya n'etiti gi. 4 Ma unu onwe-unu ndi nārapara n'aru Jehova, bú Chineke-unu, unu nādi ndu ta, unu nile. 5 Le, ezíwom unu ukpuru di iche iche na ikpé di iche íche, dika Jehova, bú Chinekem, nyerem iwu, ka unu we me otú a n'etiti ala ahu ebe unu onwe-unu nābà inweta ya. 6 Debe-kwa-nu ha, me kwa ha; n'ihi na nka bu amam-ihe-unu na nghọta-unu n'anya ndi nile, ndi gānu ukpuru ndia nile, we si, Otú ọ di, ndi mara ihe na ndi nwere nghọta ka mba uku a bu. 7 N'ihi na òle mba uku di, nke nwere chi di ya nso dika Jehova, bú Chineke-ayi, si di n'ihe nile ayi kpọkuworo Ya? 8 Òle mba uku di kwa, nke nwere ukpuru na ikpé ziri ezi dika iwu a nile, nke Mu onwem nētiye n'iru unu ta? 9 Nání lezie onwe-gi anya, debe kwa nkpuru-obi-gi nke-ọma, ka i ghara ichezọ ihe nile nke anya-gi abua huworo, ka ha ghara kwa isi n'obi-gi wezuga onwe-ha ubọchi nile nke ndu-gi; kama gi me ka umu-gi na umu umu-gi mara ha; 10 ubọchi nke i guzoro n'iru Jehova, bú Chineke-gi, nime Horeb, mb͕e Jehova sirim, Kpọkọtaram ndim, M'gēme kwa ka ha nu okwum nile, ka ha we muta itu egwum ubọchi nile nke ha onwe-ha nādi ndu n'elu ala, ka ha we zí kwa umu-ha. 11 Unu we biaru nso, guzo n'okpuru ugwu ahu; ugwu ahu nēre ọku rue obi elu-igwe, n'ọchichiri, na igwe-oji, na oké ọchichiri. 12 Jehova we si n'etiti ọku ahu gwa unu okwu: ọ bu olu okwu ka unu onwe-unu nānu, ma ọdighi onye unu nāhu anya; nání olu. 13 Ọ we gosi unu ọb͕ub͕a-ndu-Ya, nke Ọ nyere unu iwu ime, bú okwu iri ahu; Ọ we de ha n'elu mbadamba nkume abua. 14 Ọ bu kwa mu ka Jehova nyere iwu na mb͕e ahu izí unu ukpuru di iche iche na ikpé di iche iche, ka unu we me ha n'ala ahu ebe unu nāgabiga inweta ya. 15 Lezi-kwa-nu nkpuru-obi-unu anya nke-uku; n'ihi na unu ahughi udi ọ bula n'ubọchi Jehova si n'etiti ọku ahu gwa unu okwu na Horeb: 16 ka unu we ghara ibibi onwe-unu, we mere onwe-unu arusi apiri api, bú udi nke oyiyi-ihe, ihe-atù nke oké ma-ọbu nwunye, 17 ihe-atù nke anumanu ọ bula nke di n'uwa, ihe-atù nke nnunu ọ bula nke nwere nkù nke nēfe n'elu-igwe, 18 ihe-atù nke ihe ọ bula nke nākpu akpu n'ala, ihe-atù nke azù ọ bula nke di na miri n'okpuru uwa: 19 ka i we ghara kwa iweli anya-gi abua le elu-igwe, hu anyanwu na ọnwa na kpakpando, bú usu nile nke ihe elu-igwe, ewe duhie gi, i we kpọ isi ala nye ha, fè ha, bú ihe nke Jehova, bú Chineke-gi, kesaworo ndi nile n'okpuru elu-igwe nile. 20 Ma Jehova ewerewo unu, me ka unu si n'oké ọku ígwè ahu, bú Ijipt, puta, iburu Ya ndi nketa, otú ọ di ta. 21 Jehova wesa-kwa-ram iwe n'ihi okwu-unu, we ṅua iyi na m'gaghi-agabiga Jọdan, na m'gaghi-abà kwa n'ezi ala ahu, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka ọ buru ihe-nketa: 22 ma mu onwem gaje inwu n'ala nka, adighm-agabiga Jọdan: ma unu onwe-unu nāgabiga, unu gēnweta kwa ezi ala ahu. 23 Lezienu onwe-unu anya, ka unu ghara ichezọ ọb͕ub͕a-ndu nke Jehova, bú Chineke-unu, nke unu na Ya b͕ara, unu we mere onwe-unu arusi apiri api, bú udi ihe ọ bula nke Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi iwu bayere ya, si, Emela. 24 N'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, ọku nēripia eripia ka ọ bu, Chineke ekworo. 25 Mb͕e i gāmu umu, na umu umu, unu we nọ di anya n'ala ahu, duhie onwe-unu, me arusi apiri api, bú udi ihe ọ bula, i we me ihe ọjọ n'anya Jehova, bú Chineke-gi, ikpasu Ya iwe: 26 emewom ka elu-igwe na uwa b͕agide unu àmà ta, na unu gālapusi n'iyì ngwa ngwa n'ala ahu nke unu nāgabiga Jọdan ibà n'ebe ahu inweta ya; unu agaghi-eme ka ubọchi-unu di anya n'elu ya, kama agēkpochapu unu ekpochapu. 27 Jehova gēme kwa ka unu b͕asa n'etiti ndi nile, unu gāfọdu kwa ndikom ole-na-ole n'etiti mba nile ọzọ, ebe Jehova gēduga unu. 28 Unu gēfè kwa chi n'ebe ahu, ndi bu ọlu aka madu, bú osisi na nkume, nke nādighi-ahu uzọ, ha adighi-anu kwa ihe, ha adighi-eri ihe, ha adighi-anu kwa ísì. 29 Ma asi na i si n'ebe ahu chọ Jehova, bú Chineke-gi, i gāchọta kwa Ya, mb͕e i were obi-gi nile na nkpuru-obi-gi nile jua ase Ya. 30 Mb͕e nkpab͕u diri gi, mb͕e ihe nile ndia abiakwasiwo-kwa-ra gi, na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia i gālaghachikuru kwa Jehova, bú Chineke-gi, ge kwa olu-Ya nti: 31 n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, bu Chineke nwere obi-ebere; Ọ gaghi-ara gi aka, Ọ gaghi-ebibi kwa gi, Ọ gaghi-echezọ kwa ọb͕ub͕a-ndu nke nna-gi-hà, nke Ọ ṅuru ha iyi bayere ya. 32 N'ihi na biko, jua ajuju bayere ubọchi nile gara aga, nke buru gi uzọ, site n'ubọchi mb͕e Chineke kere madu n'elu uwa, site kwa n'otù nsọtu elu-igwe we rue nsọtu elu-igwe ọzọ, ma ihe dika ihe uku a adiwo, ma-ọbu na anuwo ihe di ka ya. 33 Ọ̀di ndi ọ bula nuru olu Chineke ka o nēsi n'etiti ọku kwue okwu, dika gi onwe-gi nuworo, we di ndu? 34 Ma-ọbu Chineke, Ọ̀ nwawo ibà nime otù mba isi n'etiti ya were n'Onwe-ya mba ọzọ, n'ọnwunwa di iche iche, na n'ihe-iriba-ama di iche iche, na n'ihe-ebube di iche iche, na n'agha, na n'aka di ike, na n'ogwe-aka esetiri eseti, na n'oké egwu di iche iche, dika ihe nile si di nke Jehova, bú Chineke-unu, mere unu n'Ijipt n'anya-unu? 35 Emewo ka gi onwe-gi hu ya, ka i we mara na Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke; ọ dighi onye ọzọ ma-ọbughi Ya; 36 N'elu-igwe ka O si me ka i nu olu-Ya, ka O we dọ gi aka na nti: n'elu uwa ka O me-kwa-ra gi ka i hu ọku uku Ya; i we nu okwu-Ya nile site n'etiti ọku ahu. 37 Ma n'ihi na Ọ huru nna-gi-hà n'anya, O we rọputa nkpuru-ha nọchiri ha, O we were ike uku Ya me ka i si n'Ijipt puta n'iru Ya; 38 ka O we napu mba uku di kwa ike kari gi ala-ha n'iru gi, ime ka i ba, ka O we nye gi ala-ha ibu ihe-nketa, otú ọ di ta. 39 I mawo kwa ta, cheta-kwa-ra obi-gi, na Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke n'elu-igwe di n'elu na n'elu uwa di n'okpuru: ọ dighi onye ọzọ. 40 I gēdebe kwa ukpuru-Ya nile, na ihe nile O nyere n'iwu, nke Mu onwem nēnye gi n'iwu ta, ka o we diri gi nma, di-kwa-ra umu-gi gānọchi gi, ka i we me kwa ka ubọchi-gi di anya n'elu ala ahu, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, ubọchi nile. 41 Mb͕e ahu Moses kpaputara obodo atọ n'ofè Jọdan n'uzọ ọwuwa-anyanwu; 42 ka ob͕u-madu we b͕alaga n'ebe ahu, bú onye nēb͕u ab͕ata-obi-ya nāmaghi ama, ma ya onwe-ya akpọghi ya asì na mb͕e gara aga; ka ọ we b͕alaga n'otù nime obodo ahu, we di ndu: 43 bú Biza nime ọzara, n'ala ahu di lari, ka ọ diri ndi Reuben; na Remot nime Gilead, ka ọ diri ndi Gad; na Golan nime Beshan, ka ọ diri ndi Manase. 44 Nka bu kwa iwu ahu nke Moses doro n'iru umu Israel: 45 ndia bu ihe-àmà, na ukpuru, na ikpé, nke Moses gwara umu Israel, mb͕e ha si n'Ijipt puta; 46 n'ofè Jọdan, na ndagwurugwu ahu na ncherita-iru Bet-peoa, n'ala Saihon, bú eze ndi-Amorait, onye bi na Heshbon, onye Moses na umu Israel tib͕uru, mb͕e ha si n'Ijipt puta: 47 ha we nweta ala-ya, na ala Og, bú eze Beshan, bú eze abua ndi-Amorait, ndi di n'ofè Jọdan n'uzọ ọwuwa-anyanwu; 48 site n'Aroea, nke di n'usọ ndagwurugwu Anon, we rue ugwu Saion (nke ahu bu Heamon), 49 na Araba nile n'ofè Jọdan n'uzọ ọwuwa-anyanwu, we rue oké osimiri nke Araba, n'okpuru nkpọrube Pisga.

Deuteronomi 5

1 Moses we kpọ Israel nile òkù, si ha, Israel, nurunu ukpuru ndia na ikpé ndia nke mu onwem nēkwu na nti-unu ta, ka unu we muta ha, lezi kwa anya ime ha. 2 Jehova, bú Chineke-ayi, b͕ara ndu nye ayi nime Horeb. 3 Ọ bughi nna-ayi-hà ka Jehova b͕ara ọb͕ub͕a-ndu a nye, kama ọ bu ayi, ọbuná ayi onwe-ayi, ndi nọ n'ebe a na ndu ta, ayi nile. 4 Iru na iru ka Jehova kpayere unu uka n'ugwu ahu site n'etiti ọku ahu, 5 (mu onwem nēguzo n'etiti Jehova na unu na mb͕e ahu, igosi unu okwu Jehova: n'ihi na unu turu egwu n'ihi ọku ahu, unu arigoghi kwa n'ugwu ahu; ) si, 6 Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi, Onye mere ka i si n'ala Ijipt, n'ulo ndi-orù, puta. 7 Gi enwela chi ọzọ tiyerem. 8 Gi emerela onwe-gi arusi apiri api, bú oyiyi nke udi ọ bula nke di n'elu-igwe n'elu, ma-ọbu nke di n'uwa n'okpuru ya, ma-ọbu nke di na miri n'okpuru uwa: 9 gi akpọla isi ala nye ha, efè-kwa-la ha òfùfè: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova Chineke-gi, bu Chineke ekworo, nēwere ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta kwa umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ, nke ndi nākpọm asì; 10 ma anamemere nnù umu-umu abua na ọgu iri ebere, bú nke ndi nāhum n'anya, nēdebe kwa ihe nile M'nyere n'iwu. 11 Gi eburula aha Jehova, bú Chineke-gi, ime ihe efu; n'ihi na Jehova agaghi-agu onye nēburu aha-Ya ime ihe efu n'onye ikpé nāmaghi. 12 Debe ubọchi-izu-ike, ido ya nsọ, dika Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi iwu. 13 Ubọchi isi ka i gālu ọlu, je ozi-gi nile: 14 ma ubọchi nke-asa bu ubọchi-izu-ike nke Jehova, bú Chineke-gi, nwere: i gaghi-eje ozi ọ bula nime ya, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na ehi-gi, na inyinya-ibu-gi, na anu-ulo-gi nile, na ọbìa-gi nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula; ka orù-gi nwoke na orù-gi nwayi we zuru ike dika gi onwe-gi nēzu. 15 I gēcheta kwa na i buri orù n'ala Ijipt, ma Jehova, bú Chineke-gi, were aka di ike, were kwa ogwe-aka eseteri eseti, me ka i si n'ebe ahu puta: n'ihi nka ka Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi iwu idebe ubọchi-izu-ike. 16 Sọpuru nna-gi na nne-gi, dika Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi iwu: ka ubọchi-gi we di anya, ka ọ we di-kwa-ra gi nma, n'elu ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi. 17 Gi eb͕ula madu. 18 Gi akwa-kwa-la iko. 19 Gi ezu-kwa-la ori. 20 Gi ab͕a-kwa-la àmà ugha megide madu-ibe-gi. 21 Gi enwe-kwa-la anya-uku n'ebe nwunye madu-ibe-gi nọ; agu ulo madu-ibe-gi agu-kwa-la gi, ma-ọbu ubi-ya, ma-ọbu orù-ya nwoke, ma-ọbu orù-ya nwayi, ma-ọbu ehi-ya, ma-ọbu inyinya-ibu-ya, ma-ọbu ihe ọ bula nke madu-ibe-gi nwere. 22 Okwu ndia ka Jehova were oké olu gwa nkpọkọta-unu nile n'ugwu ahu site n'etiti ọku ahu, na igwe-oji ahu, na oké ọchichiri ahu: ma Ọ tukwasighi ihe ọzọ. O we dekwasi ha na mbadamba nkume abua, were ha nyem. 23 O rue, mb͕e unu nuru olu ahu site n'etiti ọchichiri ahu na ugwu ahu nēre ọku, na unu biarurum nso, bú ndi-isi nile nke ebo nile unu, na ndi-okenye-unu; 24 unu we si, Le, Jehova, bú Chineke-ayi, emewo ka ayi hu ebube-Ya na idi-uku-Ya, ọ bu kwa olu-Ya ka ayi nuru site n'etiti ọku ahu; ta ka ayi huworo na Chineke nākpayere madu uka, ọ di kwa ndu. 25 Ma ub͕u a, n'ìhi gini ka ayi gānwu? n'ihi na ọku uku a gēripia ayi: ọ buru na ayi onwe-ayi anu kwa olu Jehova, bú Chineke-ayi, ọzọ, ayi gānwu kwa. 26 N'ihi na ònye di n'etiti anu-aru nile, nke nuworo olu Chineke di ndu ka O nēkwu okwu site n'etiti ọku, dika ayi nuru, ọ di kwa ndu? 27 Gi onwe-gi jerue nso, nu kwa ihe nile nke Jehova, bú Chineke-ayi, gēkwu: gi onwe-gi gāgwa kwa ayi ihe nile nke Jehova, bú Chineke-ayi, gāgwa gi; ayi gānu kwa, me ya. 28 Jehova we nu olu okwu nile unu, mb͕e unu gwaram okwu; Jehova we sim, Anuwom olu okwu nile nke ndi nka, nke ha gwaworo gi: ha emewo nke-ọma n'ihe nile ha kwuworo. 29 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na nkpuru-obi-ha di ha otú a, itu egwum, na idebe ihe nile M'nyere n'iwu ubọchi nile, ka ọ we diri ha nma, di-kwa-ra umu-ha, rue mb͕e ebighi-ebi! 30 Je, si ha, Laghachirinu onwe-unu n'ulo-ikwū-unu. 31 Ma gi onwe-gi, guzo n'ebe a n'akukum, ka M'gwa kwa gi ihe ahu nile M'nyere n'iwu, na ukpuru nile, na ikpé nile, nke i gēzí ha, ka ha we me ha n'ala ahu nke Mu onwem nēnye ha ka ha nweta ya. 32 Unu gēlezi kwa anya ime dika Jehova, bú Chineke-unu, nyeworo unu iwu: unu ewezugala onwe-unu n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe. 33 N'uzọ nile nke Jehova, bú Chineke-unu, nyeworo unu n'iwu ka unu ganēje, ka unu we di ndu, ka o we di-kwa-ra unu nma, ka unu we me kwa ka ubọchi-unu di anya n'ala ahu nke unu gēnweta.

Deuteronomi 6

1 Ma nka bu ihe ahu enyere n'iwu, na ukpuru nile, na ikpé nile, nke Jehova, bú Chineke-unu, nyere iwu ka ezí unu, ka unu we me ha n'ala ahu ebe unu onwe-unu nāgabiga inweta ya; 2 ka i we tua egwu Jehova, bú Chineke-gi, idebe ukpuru-Ya nile na ihe nile O nyere n'iwu, nke Mu onwem nēnye gi n'iwu, gi onwe-gi, na nwa-gi, na nwa nwa-gi, ubọchi nile nke ndu-gi; ka ubọchi-gi we di kwa anya. 3 I gānu kwa, Israel, lezi kwa anya ime ya; ka o we diri gi nma, ka unu we ba kwa uba nke-uku, dika Jehova, bú Chineke nna-gi-hà, gwaworo gi okwu, n'ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya. 4 Nuru, Israel; Jehova, bú Chineke-ayi, Jehova bu otù: 5 i gēwere kwa obi-gi nile, were kwa nkpuru-obi-gi nile, were kwa ike-gi nile, hu Jehova, bú Chineke-gi, n'anya. 6 Okwu ndia, nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, gādikwasi kwa n'obi-gi: 7 i gējisi kwa ike izí ha-umu-gi, i gēkwu kwa okwu bayere ha mb͕e i nānọdu n'ulo-gi, na mb͕e i nēje ije n'uzọ, na mb͕e i nēdina ala, na mb͕e i nēbili ọtọ. 8 I gēke kwa ha n'elu aka-gi ka ha buru ihe-iriba-ama, ha gābu kwa nkpọ-n'iru n'etiti anya-gi abua. 9 I gēdekwasi kwa ha n'awara-uzọ abua nke ulo-gi, na n'ọnu-uzọ-ama-gi nile. 10 O gēru kwa, mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gēme ka i ba n'ala ahu nke Ọ ṅuru nna-gi-hà, bú Abraham, na Aisak, na Jekob, iyi, inye gi; obodo uku di iche iche ma-kwa-ra nma, nke i nēwughi, 11 na ulo juputara n'ezi ihe nile, nke i nēmejughi, na olùlù-miri egwuwara egwuwa, nke i nēgwuwaghi, na ubi-vine na osisi olive, nke i nākughi, mb͕e i gēri kwa, afọ eju kwa gi; 12 gi lezie onwe-gi anya, ka i ghara ichezọ Jehova, Onye mere ka i si n'ala Ijipt, si kwa n'ulo ndi-orù, puta. 13 Jehova, bú Chineke-gi, ka i gātu egwu; ọ bu kwa Ya ka i gēfè òfùfè, ọ bu kwa aha-Ya ka i gēwere ṅu iyi. 14 Unu ejesola chi ọzọ, ndi sitere na chi nke ndi ahu ndi nọ unu buruburu; 15 n'ihi na Chineke ekworo ka Jehova, bú Chineke-gi, bu n'etiti gi; ka iwe Jehova, bú Chineke-gi, we ghara idi ọku megide gi, O we kpochapu gi n'elu ala. 16 Unu anwala Jehova, bú Chineke-unu, dika unu nwara Ya nime Masa. 17 Unu gējisi ike idebe ihe ahu nile nke Jehova, bú Chineke-unu, nyere n'iwu, unu gēdebe kwa ihe-àmà-Ya nile, na ukpuru-Ya nile, nke O nyeworo gi n'iwu. 18 I gēme kwa ihe ziri ezi na nke di nma n'anya Jehova: ka o we diri gi nma, ka i we ba kwa, nweta ezi ala ahu, nke Jehova ṅuru nna-gi-hà iyi inye ha, 19 ikwapu ndi-iro-gi nile n'iru gi, dika Jehova kwuworo. 20 Mb͕e nwa-gi gāju gi n'ọdi-n'iru, si, Gini bu isi ihe-àmà ndia, na ukpuru ndia, na ikpé ndia, nke Jehova, bú Chineke-ayi, nyeworo unu n'iwu? 21 i gāsi kwa nwa-gi, Ayi buru Fero ndi-orù n'Ijipt; Jehova we were aka di ike me ka ayi si n'Ijipt puta: 22 Jehova we tiyekwasi ihe-iriba-ama di iche iche na ihe-ebube di iche iche, di uku jọ kwa njọ, n'aru Ijipt, na n'aru Fero, na n'aru ulo-ya nile, n'anya-ayi: 23 ọ bu kwa ayi ka O mere ka ayi si n'ebe ahu puta, ka O we me ka ayi ba nime, ka O we nye ayi ala ahu nke Ọ ṅuru nna-ayi-hà iyi inye ha. 24 Jehova we nye ayi iwu ime ukpuru ndia nile, itu egwu Jehova, bú Chineke-ayi, ka o we diri ayi nma ubọchi-ayi nile, ka O we debe ayi ndu, otú ọ di ta. 25 Ezi omume ka ọ gābu-kwa-ra ayi, mb͕e ayi gēlezi anya ime ihe a nile enyere n'iwu n'iru Jehova, bú Chineke-ayi, dika O nyere ayi iwu.

Deuteronomi 7

1 Mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gēme ka i ba n'ala ahu ebe gi onwe-gi nābà inweta ya, mb͕e Ọ gēwepu kwa ọtutu mba n'iru gi, bu ndi Het, na ndi-Giagashait, na ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus, mba asa bara uba di kwa ike kari gi; 2 mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gāra kwa ha nye n'iru gi, i we tib͕ue ha; i gēwezugasi kwa ha ka ebibie ha; gi na ha ab͕ala ndu, eme-kwa-la ha amara: 3 gi na ha alurita-kwa-la nwunye; enyela nwa-ya nwoke nwa-gi nwayi, ekuru-kwa-la nwa-ya nwayi nye nwa-gi nwoke. 4 N'ihi na ọ gēwezuga nwa-gi nwoke n'isom n'azu, ka ha we fè chi ọzọ: iwe Jehova gādi kwa ọku megide unu, Ọ gēkpochapu kwa gi ngwa ngwa. 5 Kama otú a ka unu gēme ha; unu gākwatu ebe-ichu-àjà nile ha, tupia kwa ogidi nile ha, b͕utu kwa Asherim-ha, sure kwa arusi nile ha apiri api n'ọku. 6 N'ihi na ndi nsọ ka i buru Jehova, bú Chineke-gi: ọ bu gi ka Jehova, bú Chineke-gi, rọputaworo iburu Ya ihe nke aka Ya, kari ndi nile ndi nọ n'elu ala. 7 Ọ bughi na unu bara uba kari ndi nile ka Jehova huru unu n'anya si-ike, we rọputa unu; n'ihi na unu onwe-unu di ole-na-ole kari ndi nile ọzọ: 8 kama ọ bu n'ihi na Jehova huru unu n'anya, na n'ihi na O debere iyi Ọ ṅuru nna-unu-hà, ka Jehova were aka di ike me ka unu puta, O we b͕aputa unu n'ulo ndi-orù, n'aka Fero, bú eze Ijipt. 9 I gāmara kwa na Jehova, bú Chineke-gi, Ya onwe-ya bu Chineke; Chineke ahu Nke kwesiri ntukwasi-obi, nēdebere ndi huru Ya n'anya, ndi nēdebe kwa ihe nile O nyere n'iwu, ọb͕ub͕a-ndu-Ya na ebere-Ya rue nnù ọb͕ọ abua na ọgu iri; 10 Ọ nākwughachi kwa ndi nākpo Ya asì n'iru ha, ime ka ha la n'iyì: Ọ gaghi-alara onye nākpọ Ya asì azu, n'iru ya ka Ọ gākwughachi ya. 11 I gēdebe kwa ihe ahu enyere n'iwu, na ukpuru nile, na ikpé nile, nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, ka i we me ha. 12 Ọ gēru kwa, n'ihi na unu nānu ikpé ndia, debe kwa ha, me kwa ha, na Jehova, bú Chineke-gi, gēdebe-kwa-ra gi ọb͕ub͕a-ndu ahu na ebere ahu nke Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi imere ha: 13 Ọ gāhu kwa gi n'anya, gọzie gi, me ka i ba uba: Ọ gāgọzi kwa nkpuru nke afọ-gi, na nkpuru nke ala-gi, bú ọka-gi, na manya-vine ọhu gi, na manu-gi, na umu ehi-gi muru, na umu ìgwè ewu na aturu-gi, n'elu ala ahu nke Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi inye gi. 14 Ndi agọziri agọzi ka i gābu kari ndi nile ọzọ: nwoke nēnweghi ike imu nwa na nwayi-àgà agaghi-adi n'etiti gi, ma-ọbu n'etiti anu-ulo-gi. 15 Jehova gēwezuga kwa n'aru-gi ọria nile; nriaria ọjọ nile nke Ijipt nke i maworo, Ọ gaghi-atukwasi kwa ha n'aru-gi, ma Ọ gētiye ha n'aru ndi nākpọ gi asì. 16 I gēripia kwa ndi ahu nile nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi; anya-gi agaghi-emere ha ebere: efè-kwa-la chi-ha di iche iche òfùfè; n'ihi na ọnyà ka ọ gāburu gi. 17 Mb͕e i gāsi n'obi-gi, Mba ndia bara uba karim; #m'gēsi aṅa pu inapu ha ala-ha? 18 atula egwu ha: i gēcheta nke-ọma ihe nke Jehova, bú Chineke-gi, mere Fero, me kwa Ijipt nile; 19 ọnwunwa uku nile nke anya-gi huru, na ihe-iriba-ama nile, na ihe-ebube nile, na aka ahu di ike, na ogwe-aka ahu esetiri eseti, nke Jehova, bú Chineke-gi, ji me ka i puta: otú a ka Jehova, bú Chineke-gi, gēme ndi ahu nile ndi gi onwe-gi nātu egwu ha. 20 Ọzọ kwa, ọ bu ebu ka Jehova, bú Chineke-gi, gēsì n'etiti ha, rue mb͕e ndi fọduru, ndi nēzopu kwa onwe-ha n'iru gi, gāla n'iyì. 21 Amala jijiji n'iru ha: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nọ n'etiti gi, Ọ bu Chineke uku, di kwa egwu. 22 Ma Jehova, bú Chineke-gi, gēwepu mba ahu n'iru-gi nke-ntà nke-ntà: i pughi ime ka ha gwusia ngwa ngwa, ka anu-ọhia ghara iba uba megide gi. 23 Ma Jehova, bú Chineke-gi, gāra ha nye n'iru gi, me kwa ka ha b͕a aghara uku, rue mb͕e agēkpochapu ha. 24 Ọ gēnye kwa ndi-eze-ha n'aka-gi, i gēme kwa ka aha-ha lapu n'iyì n'okpuru elu-igwe: ọ dighi nwoke ọ bula gēguzo onwe-ya n'iru gi, rue mb͕e i gēkpochapu ha. 25 Unu gēsure arusi nile apiri api nke chi nile ha n'ọku: enwela anya-uku n'ọla-ọcha na ọla-edo nke di n'aru ha, ewe-kwa-la n'onwe-gi, ka aghara ima gi n'ọnyà nime ya: n'ihi na ihe-árú nke Jehova, bú Chineke-gi, ka ọ bu: 26 eme-kwa-la ka ihe-árú ba n'ulo-gi, i we ghọ ihe ewezugara ka ebibie ya dika ya: i gājusi ya aju, kpọ kwa ya ihe rusiri árú; n'ihi na ihe ewezugara ka ebibie ya ka ọ bu.

Deuteronomi 8

1 Ihe nile enyere n'iwu nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, unu gēlezi anya ime ya, ka unu we di ndu, ba uba, we ba nime, nweta kwa ala ahu nke Jehova ṅuru nna-unu-hà iyi inye ha. 2 I gēcheta kwa uzọ nile nke Jehova, bú Chineke-gi, mere gi ka i je ọgu arọ abua ndia n'ọzara, ka O we weda gi n'ala, inwa gi, ka O we mara ihe nke di n'obi-gi, ma i gēdebe ihe nile O nyere n'iwu, ma-ọbu na i gaghi-edebe. 3 O we weda gi n'ala, me ka agu gua gi, O we me ka i rie manna ahu, nke i nāmaghi, nke nna-gi-hà nāmaghi kwa; ka O we me ka i mara na ọ bughi nání achicha ka madu gēji di ndu, kama ọ bu ihe nile ọ bula nke nēsi n'ọnu Jehova puta ka madu gēji di ndu. 4 Uwe-nb͕okwasi-gi akapughi nká n'aru gi, ukwu-gi azaghi kwa aza, ọgu arọ abua ndia. 5 I gāma kwa n'obi-gi, na, dika nwoke si adọ nwa-ya nwoke aka na nti, otú a ka Jehova, bú Chineke-gi, nādọ gi aka na nti. 6 I gēdebe kwa ihe Jehova, bú Chineke-gi, nyere n'iwu, ka i we je ije n'uzọ-Ya nile, tu kwa egwu Ya. 7 N'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nēme ka i ba n'ezi ala, bú ala iyi miri, na nke isi-iyi na ob͕u-miri, nāputa na ndagwurugwu na n'ugwu: 8 ala nke ọka wheat na ọka barley, na osisi vine, na osisi fig, na pomegranate; ala nke osisi olive nēnye manu, na nke manu-aṅu; 9 ala nke ọ bughi n'idi-ukọ ka i gēri nri nime ya, ọ dighi ihe ọ bula gākọ gi nime ya; ala nke nkume-ya bu ígwè, nke i gēgwuputa kwa ọla n'ugwu-ya. 10 I gēri kwa, afọ gēju kwa gi, i gāgọzi kwa Jehova, bú Chineke-gi, n'elu ezi ala ahu nke O nyeworo gi. 11 Lezie onwe-gi anya ka i ghara ichezọ Jehova, bú Chineke-gi, n'edebeghi ihe nile O nyere n'iwu, na ikpé-Ya nile, na ukpuru-Ya nile, nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta: 12 ka o we ghara ibu, mb͕e i nēri ihe, riju afọ, wu kwa ezi ulo, we biri nime ha: 13 mb͕e ìgwè ehi-gi na ìgwè ewu na aturu-gi nāba kwa uba, mb͕e ọla-ọcha na ọla-edo nāba-kwa-ra gi uba, mb͕e ihe nile i nwere nāba kwa uba; 14 na obi-gi gādi elu, i we chezọ Jehova, bú Chineke-gi, Onye nēme ka i si n'ala Ijipt, si kwa n'ulo ndi-orù, puta; 15 Onye nēme ka i je ije n'ọzara uku ahu nke di egwu, nke agwọ nke yiri ọku na akpi di nime ya, na ala akpiri-ikpọ-nku nke miri nādighi ya; Onye nēme ka miri si n'oké nkume ọmu ahu putara gi; 16 Onye nēme ka i rie manna n'ọzara, nke nna-gi-hà nāmaghi; ka O we weda gi n'ala, ka O we nwa kwa gi, ime gi nma n'ikpe-azu-gi: 17 i we si n'obi-gi, Ikem na ume akam emetaworom àkù a. 18 Ma i gēcheta Jehova, bú Chineke-gi, n'ihi na Ya onwe-ya bu onye nēnye gi ike imeta àkù; ka Ọ we me ka ọb͕ub͕a-ndu-Ya guzosie ike, nke Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi imere ha, otú ọ di ta. 19 Ọ gēru kwa, ọ buru na i chezọ Jehova, bú Chineke-gi, we nējeso chi ọzọ, fè ha òfùfè, kpọ kwa isi ala nye ha, ab͕awom àmà megide unu ta na unu aghaghi ila n'iyì. 20 Dika mba ahu ndi Jehova nēme ka ha la n'iyì n'iru unu, otú a ka unu gāla n'iyì; n'ihi na unu egeghi nti n'olu Jehova, bú Chineke-unu.

Deuteronomi 9

1 Nuru, Israel: gi onwe-gi nāgabiga Jọdan ta, ibà ka i we nweta mba di iche iche di uku di kwa ike kari gi, obodo di iche iche di uku nke ewusi-kwa-ra ike rue elu-igwe; 2 otù ndi di uku di kwa ogologo, bú umu ndi Anak, ndi gi onwe-gi mara, ndi gi onwe-gi nuwo-kwa-ra okwu bayere ha, si, Ònye gēguzo onwe-ya n'iru umu Anak? 3 Ma i mawo ta, na Jehova, bú Chineke-gi, Ya onwe-ya bu onye nāgabiga n'iru gi dika ọku nēripia eripia; Ya onwe-ya gēkpochapu ha, Ya onwe-ya gēme kwa ka ha ruru ala n'iru gi: i we napu ha ala-ha, me kwa ka ha la n'iyì ngwa ngwa, dika Jehova gwaworo gi okwu. 4 Ekwula n'obi-gi, mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, kwapusiri ha n'iru gi, si, N'ihi ezi omumem ka Jehova mere ka m'bata inweta ala nka: ma ọ bu n'ihi nmebi-iwu nke mba ndia ka Jehova nānapu ha ala-ha n'iru gi. 5 Ọ bughi n'ihi ezi omume-gi, ma-ọbu n'ihi nziri-ezi nke obi-gi, ka gi onwe-gi nābà inweta ala-ha: kama ọ bu n'ihi nmebi-iwu nke mba ndia ka Jehova, bú Chineke-gi, nānapu ha ala-ha n'iru gi, ka Ọ we me kwa ka okwu ahu guzosie ike nke Jehova ṅuru nna-gi-hà iyi, bú Abraham, na Aisak, na Jekob. 6 I mawo kwa na ọ bughi n'ihi ezi omume-gi ka Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ezi ala nka ka i nweta ya; n'ihi na ndi kwesiri olu ike ka i bu. 7 Cheta, echezọla, ihe nke i ji kpasu Jehova, bú Chineke-gi, iwe n'ọzara: site n'ubọchi mb͕e i si n'ala Ijipt puta, rue mb͕e unu biaruru ebe a, ndi nānupu isi ka unu buworo n'ebe Jehova nọ. 8 Na Horeb ka unu kpasu-kwa-ra Jehova iwe, Jehova we wesa unu iwe ikpochapu unu. 9 Mb͕e m'rigoro n'ugwu inara mbadamba nkume abua ahu, bú mbadamba nkume nke ọb͕ub͕a-ndu ahu nke Jehova b͕ara nye unu, m'we nọdu n'ugwu ahu ọgu ubọchi abua ehihie na abali; ọ dighi nri m'riri, ọ dighi kwa miri m'ṅuru. 10 Jehova we nyem mbadamba nkume abua ahu nke ewere nkpisi-aka Chineke de; edekwasi-kwa-ra n'elu ha dika okwu nile si di nke Jehova gwara unu n'ugwu ahu site n'etiti ọku ahu n'ubọchi nkpọkọta ahu. 11 O rue, n'ọgwugwu ọgu ubọchi abua, ehihie na abali, na Jehova nyerem mbadamba nkume abua ahu, bú mbadamba nkume nke ọb͕ub͕a-ndu ahu. 12 Jehova we sim, Bilie, si n'ebe a rida ngwa ngwa; n'ihi na ndi-gi, nke i meworo ka ha si n'Ijipt puta, ebibiwo onwe-ha; ha esiwo n'uzọ nke M'nyere ha n'iwu wezuga onwe-ha ngwa ngwa; ha emeworo onwe-ha nwa-ehi awuru awu. 13 Jehova we gwam okwu, si Ahuwom ndi nka, ma, le, ndi kwesiri olu ike ka ọ bu: 14 ram aka, ka M'we kpochapu ha, hichapu kwa aha-ha n'okpuru elu-igwe: M'gēme kwa gi ka i buru mba di ike ba kwa uba kari ha. 15 M'we chigharia, si n'ugwu ahu rida, ugwu ahu nēre kwa ọku: mbadamba nkume abua nke ọb͕ub͕a-ndu ahu di kwa n'elu akam abua. 16 M'we hu, ma, le, unu emehiewo megide Jehova, bú Chineke-unu; unu emeworo onwe-unu nwa-ehi awuru awu: unu esiwo n'uzọ nke Jehova nyere unu n'iwu wezuga onwe-unu ngwa ngwa. 17 M'we jide mdadamba nkume abua ahu, tupu ha n'akam abua, tupia ha n'anya-unu. 18 M'we turu onwem n'ala n'iru Jehova, dika na mbu, ọgu ubọchi abua ehihie na abali; ọ dighi nri m'riri, ọ dighi kwa miri m'ṅuru; n'ihi nmehie-unu nile nke unu mehiere, n'ime ihe ọjọ ahu n'anya Jehova, ikpasu Ya iwe. 19 N'ihi na ujọ iwe na ọnuma, nke Jehova ji we iwe megide unu ikpochapu unu, turum. Ma Jehova ge-kwa-ram nti na mb͕e ahu. 20 Jehova wesa-kwa-ra Eron iwe nke-uku ikpochapu ya: m'we kpe kwa ekpere bayere Eron na mb͕e ahu. 21 Nmehie-unu ahu, bú nwa-ehi ahu nke unu mere, m'we were ya sure ya n'ọku, zọpia ya, gwe ya nke-ọma, rue mb͕e ọ mere imurimu dika uzuzu: m'we wuye uzuzu-ya nime miri-iyi nke si n'ugwu ahu nērùdata. 22 Ọ bu kwa nime Tabera, na nime Masa, na nime Kibrot-hataava, ka unu bu ndi nākpasu Jehova iwe. 23 Mb͕e Jehova siri na Kedesh-banea ziga unu, si, Rigonu, nweta ala ahu nke M'nyeworo unu; unu we nupu isi n'okwu-ọnu Jehova, bú Chineke-unu, unu ekweghi kwa Ya, unu egeghi kwa nti n'olu-Ya. 24 Ndi nānupu isi ka unu bu n'ebe Jehova nọ site n'ubọchi m'mara unu. 25 M'we turu onwem n'ala n'iru Jehova ọgu ubọchi abua ahu, ehihie na abali, nke m'tururu onwem n'ala; n'ihi na Jehova siri na Ọ gēkpochapu unu. 26 M'we kpere Jehova, si, Onye-nwe-ayi Jehova, ebibila ndi-Gi na ihe-nketa-Gi, nke I b͕aputaworo n'idi-uku-Gi, nke I wereworo aka di ike me ka o si n'Ijipt puta. 27 Cheta ndi-orù-Gi, bú Abraham, na Aisak, na Jekob; echela iru n'ikwesi-olu-ike nke ndi nka, ma-ọbu na nmebi-iwu-ha, ma-ọbu na nmehie-ha: 28 ka ala ahu nke I mere ka ayi si n'ebe ahu puta we ghara isi, N'ihi na Jehova apughi ime ka ha ba n'ala ahu nke Ọ gwara ha okwu bayere ya, na n'ihi na Ọ kpọrọ ha asì, O mewo ka ha puta ka O we me ka ha nwua n'ọzara. 29 Ma ha onwe-ha bu ndi-Gi na ihe-nketa-Gi, ndi I were ike uku Gi na ogwe-aka-Gi eseteri eseti me ka ha puta.

Deuteronomi 10

1 Na mb͕e ahu Jehova sirim, Wara onwe-gi mbadamba nkume abua dika nke-mbu, rigokutem rue ugwu a, me-kwa-ra onwe-gi ib͕e osisi. 2 M'gēdekwasi kwa na mbadamba nkume ahu okwu nile nke di n'elu mbadamba nkume mbu, nke i tupiara, i gētiye kwa ha nime ib͕e ahu. 3 M'we me ib͕e osisi acacia, wa mbadamba nkume abua dika nke-mbu, we rigo n'ugwu ahu, mbadamba nkume abua ahu di kwa n'akam. 4 O we dekwasi na mbadamba nkume ahu, dika odide mbu ahu si di, okwu iri ahu, nke Jehova gwara unu n'ugwu ahu site n'etiti ọku ahu n'ubọchi nkpọkọta ahu: Jehova we nyem ha. 5 M'we chigharia si n'ugwu ahu rida, tiye mbadamba nkume ahu nime ib͕e ahu nke m'mereri; ha di kwa n'ebe ahu, dika Jehova nyerem iwu. 6 (Umu Israel we si na Beerot Bene-jaakan bulie ije rue Mosira: n'ebe ahu ka Eron nwuru, ewe lìe ya n'ebe ahu; Eleeza, bú nwa-ya, we buru onye-nchu-àjà n'ọnọdu ya. 7 Ha si n'ebe ahu bulie ije rue Gudgoda, si na Gudgoda je rue Jọtbata, bú ala iyi miri. 8 Na mb͕e ahu ka Jehova kewaputara ebo Livai, ibū ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, iguzo n'iru Jehova ijere Ya ozi, na igọzi n'aha-Ya, rue ta. 9 N'ihi ya Livai esoghi umu-nne-ya nwe òkè ma-ọbu ihe-nketa; Jehova onwe-ya bu ihe-nketa-ya, dika Jehova, bú Chineke-gi, gwara ya okwu. ) 10 Mu onwem guzo-kwa-ra n'ugwu ahu, dika na mb͕e mbu, ọgu ubọchi abua, ehihie na abali: Jehova we gekwam nti na mb͕e ahu; Jehova achọghi ibibi gi. 11 Jehova we sim, Bilie, je ka i bulie ije n'iru ndi nkem; ha gābà kwa, nweta ala ahu, nke M'ṅuru ndi bu nna-ha iyi inye ha. 12 Ma ub͕u a, Israel, gini ka Jehova, bú Chineke-gi, nāriọ n'aka-gi, ma-ọbughi itu egwu Jehova, bú Chineke-gi, ije ije n'uzọ-Ya nile, na ihu Ya n'anya, na iwere obi-gi nile na nkpuru-obi-gi nile fè Jehova, bú Chineke-gi, òfùfè, 13 idebe ihe nile Jehova nyere n'iwu, na ukpuru-Ya nile, nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta ka ọ we diri gi nma? 14 Le, Jehova, bú Chineke-gi, nwe elu-igwe, na elu-igwe nke elu-igwe nile, na uwa, na ihe nile nke di nime ya. 15 Nání na ihe nna-unu-hà di Jehova ezi utọ ka O we hu ha n'anya, O we rọputa nkpuru-ha nọchiri ha, bú unu onwe-unu, n'etiti ndi nile, otú ọ di ta. 16 Bì-kwa-nu obi-unu úgwù, unu abu-kwa-la ndi kwesiri olu ike ọzọ. 17 N'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, Ya onwe-ya bu Chineke kachasi chi nile, na Onye-nwenu kachasi ndi-nwenu nile, Chineke uku ahu, bú dike, di kwa egwu, Onye nāhughi madu iru-ọma n'ikpé, Onye nānaraghi ihe-iri-ngo. 18 Ọ nēme ihe ekpere n'ikpe bayere nwa-nb͕ei na nwayi di-ya nwuru, Ọ nāhu kwa ọbìa n'anya, inye ya nri na uwe-nb͕okwasi. 19 Hu-kwa-nu ọbìa n'anya: n'ihi na ọ bu ndi-ọbìa ka unu buri n'ala Ijipt. 20 Jehova, bú Chineke-gi, ka i gātu egwu; Ya ka i gēfè, Ya ka i gārapara n'aru, aha-Ya ka i gēji ṅu iyi. 21 Ya Onwe-ya bu otuto-gi, Ya Onwe-ya bu kwa Chineke-gi, Onye meworo gi ihe uku ndia di egwu, nke anya-gi huworo. 22 Ọ bu ọgu madu atọ na iri ka nna-gi-hà ji rida n'Ijipt; ma ub͕u a Jehova, bú Chineke-gi, emewo gi ka i di ka kpakpando elu-igwe n'uba.

Deuteronomi 11

1 I gāhu kwa Jehova, bú Chineke-gi, n'anya, debe ihe-ndebe-Ya, na ukpuru-Ya nile, na ikpé-Ya nile, na ihe nile Ọ nyere n'iwu, ubọchi-gi nile. 2 Ma unu amawo ta: n'ihi na ọ bughi umu-unu ka m'nāgwa okwu, bú ndi nāmaghi, ndi nāhughi kwa idọ-aka-na-nti nke Jehova, bú Chineke-unu, na idi-uku-Ya, na aka-Ya di ike, na ogwe-aka-Ya esetiri eseti, 3 na ihe-iriba-ama-Ya nile, na omume-Ya nile, nke Ọ mere Fero eze Ijipt, me kwa ala-ya nile, n'etiti Ijipt; 4 na ihe O mere usu-ndi-agha Ijipt, me kwa inyinya-ha, me kwa ub͕ọ-ala-ha; mb͕e O mere ka miri Oké Osimiri Uhie rukpuchie iru-ha mb͕e ha nāchu unu n'azu, Jehova we me ka ha la n'iyì rue ta; 5 na ihe O mere unu n'ọzara, rue mb͕e unu biaruru ebe a; 6 na ihe O mere Detan na Abairam, umu Eliab, nwa Reuben; mb͕e ala saghepuru ọnu-ya, loda ha, na ezi-na-ulo nile ha, na ulo-ikwū nile ha, na ihe ọ bula di ndu nke di n'ukwu-ha, n'etiti Israel nile: 7 ma ọ bu anya-unu nāhu omume uku nile nke Jehova, nke O meworo. 8 Unu gēdebe kwa ihe nile enyere n'iwu nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, ka unu we di ike, ba nime, nweta ala ahu, ebe unu onwe-unu nāgabiga inweta ya; 9 ka unu we me kwa ka ubọchi-unu di anya n'elu ala ahu nke Jehova ṅuru nna-unu-hà iyi inye ha, inye kwa nkpuru-ha, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù erù nime ya. 10 N'ihi na ala ahu, ebe gi onwe-gi nābà nime inweta ya, ọ bughi dika ala Ijipt ka ọ bu, ebe unu si puta, ebe i nāgha nkpuru-gi, were ukwu-gi nāb͕a ya miri, dika akwukwọ nri ubi ab͕ara ogige: 11 ma ala ahu, ebe unu nāgabiga inweta ya, bu ala ugwu na ndagwurugwu; site na miri-ozuzo nke elu-igwe ka ọ nāṅu miri: 12 ọ bu ala nke di Jehova, bú Chineke-gi, n'obi; mb͕e nile ka anya Jehova, bú Chineke-gi, nādikwasi ya, site na mb͕e mbu nke arọ we rue mb͕e ikpe-azu nke arọ. 13 O gēru kwa, ọ buru na unu ejisie ike ige nti ihem nile enyere n'iwu, nke Mu onwem nēnye unu n'iwu ta, ihu Jehova, bú Chineke-unu, n'anya, na iwere obi-unu nile na nkpuru-obi-unu nile fè Ya òfùfè, 14 na m'gēnye miri-ozuzo ala-unu na mb͕e-ya, miri-ozuzo mbu na miri-ozuzo ikpe-azu, ka i we chikọta ọka-gi, na manya-vine ọhu gi, na manu-gi. 15 M'gēnye kwa anu-ulo-gi ihe-ọkuku n'ubi-gi, i gēri kwa, afọ gēju kwa gi. 16 Lezienu onwe-unu anya, ka ewe ghara irafu obi-unu, unu ewe wezuga onwe-unu, fè chi ọzọ òfùfè, kpọ isi ala nye ha; 17 iwe Jehova we di ọku megide unu, O we b͕ochie elu-igwe, ka miri-ozuzo we ghara idi, ka ala we ghara kwa imi ihe-ọmume-ya; unu we si n'ezi ala ahu, nke Jehova nēnye unu, la n'iyì ngwa ngwa. 18 Unu gēdo kwa okwu ndia n'obi-unu na nime nkpuru-obi-unu; unu gēke kwa ha n'elu aka-unu ka ha buru ihe-iriba-ama, ha gābu kwa nkpọ-n'iru n'etiti anya-unu. 19 Unu gēzí umu-unu ha, n'ikwu okwu bayere ha mb͕e i nānọdu n'ulo-gi, na mb͕e i nēje ije n'uzọ, na mb͕e i nēdina ala, na mb͕e i nēbili ọtọ. 20 I gēdekwasi kwa ha n'awara-uzọ abua nke ulo-gi, na n'ọnu-uzọ-ama-gi nile: 21 ka ubọchi-unu we ba uba, ha na ubọchi umu-unu, n'elu ala ahu nke Jehova ṅuru nna-unu-hà iyi inye ha, dika ubọchi elu-igwe nke di n'elu uwa. 22 N'ihi na ọ buru na unu ejisie ike idebe ihe nile a enyere n'iwu nke mu onwem nēnye unu n'iwu, ka unu we me ya; ihu Jehova, bú Chineke-unu, n'anya, ije ije n'uzọ-Ya nile, na irapara n'aru Ya; 23 Jehova gānapu kwa mba ndia nile ala-ha n'iru unu, unu gēnweta kwa mba di iche iche di uku di kwa ike kari unu. 24 Ebe ọ bula nke ọbu-ukwu-unu gāzọkwasi ka unu gēnwe: site n'ọzara, na Lebanon, site n'osimiri ahu, bú osimiri Yufretis, we rue oké osimiri nke di n'azu, gābu ókè-ala unu. 25 Ọ dighi nwoke ọ bula gēguzo onwe-ya n'iru unu: ujọ-unu na egwu-unu ka Jehova, bú Chineke-unu, gātukwasi n'iru ala ahu nile nke unu gāzọkwasi, dika Ọ gwaworo unu okwu. 26 Le, mu onwem nētiye n'iru unu ta ngọzi na nkọcha; 27 ngọzi ahu, ma asi na unu ege nti ihe nile Jehova, bú Chineke-unu, nyere n'iwu, bú nke mu onwem nēnye unu n'iwu ta: 28 ma nkọcha ahu, ma ọ buru na unu egeghi nti ihe nile Jehova, bú Chineke-unu, nyere n'iwu, ma unu ewezuga onwe-unu n'uzọ ahu nke Mu onwem nēnye unu n'iwu ta, ka unu we jeso chi di iche iche ọzọ, nke unu nāmaghi. 29 Ọ gēru kwa, mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gēme ka i ba n'ala ahu, ebe gi onwe-gi nābà nime inweta ya, na i gētiye ngọzi ahu n'elu ugwu Geraizim, tiye kwa nkọcha ahu n'elu ugwu Ibal. 30 Ugwu ndia, hà adighi n'ofè Jọdan, n'azu uzọ ọdida-anyanwu, n'ala ndi Kenean ndi bi n'Araba, na ncherita-iru Gilgal, n'akuku osisi terebinth nke More? 31 N'ihi na unu onwe-unu nāgabiga Jọdan ibà nime inweta ala ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, nēnye unu, unu gēnweta kwa ya, biri nime ya. 32 Unu gēlezi kwa anya ime ukpuru nile na ikpé nile nke mu onwem nētiye n'iru unu ta.

Deuteronomi 12

1 Ndia bu ukpuru ahu na ikpé ahu, nke unu gēlezi anya ime n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke nke nna-gi-hà, nyeworo gi ka i nweta ya, ubọchi nile nke unu onwe-unu nādi ndu n'elu ala ahu. 2 Unu aghaghi ime ka ebe ahu nile la n'iyì, bú ebe mba nile unu nēnweta fère chi nile ha òfùfè, n'elu ugwu nile ha di elu, na n'elu ugwu ntà nile ha, na n'okpuru osisi ndu ọ bula: 3 unu gākwatu kwa ebe-ichu-àjà nile ha, tupia ogidi nile ha, sure Asherim-ha n'ọku, b͕utu arusi nile apiri api nke chi nile ha, we me ka aha-ha lapu n'iyì n'ebe ahu. 4 Unu emerela Jehova, bú Chineke-unu, otú a. 5 Kama rue ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, gārọputa n'ebo-unu nile, itiye aha-Ya n'ebe ahu, rue ebe-obibi-Ya ka unu gāchọ, i gābà kwa n'ebe ahu: 6 ọ bu kwa n'ebe ahu ka unu gēweta àjà-nsure-ọku nile unu, na àjà nile unu, na otù uzọ n'uzọ iri nke ihe-unu nile, na àjà-nbuli nke aka-unu, na ihe-nkwa nile unu, na onyinye-afọ-ofufo nile unu, na umu eburu uzọ mu nke ìgwè ehi-unu na ìgwè ewu na aturu-unu: 7 unu gēri kwa ihe n'ebe ahu n'iru Jehova, bú Chineke-unu, unu gāṅuri kwa ọṅu n'ihe nile unu nēseti aka-unu ime, unu onwe-unu na ulo-unu, nke Jehova, bú Chineke-gi, gọziworo gi nime ha. 8 Unu emela dika ihe nile si di nke ayi onwe-ayi nēme n'ebe a ta, nwoke ọ bula ọ nēme ihe ziri ezi n'anya-ya: 9 n'ihi na unu akābaghi rue ub͕u a n'izu-ike ahu, na n'ihe-nketa ahu, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi. 10 Ma mb͕e unu gabigara Jọdan, biri n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, nēme ka unu keta, mb͕e O mesi-kwa-ra ka unu zuru ike pua n'aka ndi-iro-unu buruburu, unu we biri na ntukwasi-obi; 11 ọ gēru kwa, na ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, gārọputa ime ka aha-Ya biri n'ebe ahu, n'ebe ahu ka unu gēwebata ihe nile m'nēnye unu n'iwu; àjà-nsure-ọku nile unu, na àjà nile unu, na otù uzọ n'uzọ iri nke ihe-unu nile, na àjà-nbuli nke aka-unu, na ihe-nkwa-unu nile arọputara arọputa nke unu nēkwe Jehova: 12 unu gāṅuri kwa ọṅu n'iru Jehova, bú Chineke-unu, unu onwe-unu, na umu-unu ndikom, na umu-unu ndinyom, na orù-unu ndikom, na orù-unu ndinyom, na onye Livai nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-unu ọ bula; n'ihi na o soghi unu nwe òkè ma-ọbu ihe-nketa. 13 Lezie onwe-gi anya ka i ghara isure àjà-nsure-ọku-gi n'ebe ọ bula i gāhu: 14 kama n'ebe nke Jehova gārọputa n'otù nime ebo-gi, n'ebe ahu ka i gēsure àjà-nsure-ọku-gi nile, ọ bu kwa n'ebe ahu ka i gēme ihe nile nke mu onwem nēnye gi n'iwu. 15 Otú ọ di, n'agu nile nke nkpuru-obi-gi ka i gēb͕u, ri kwa anu nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, dika ngọzi nke Jehova, bú Chineke-gi, nke O nyeworo gi, si di: onye ruru árú na onye di ọcha gēri ya: dika mb͕ada, na dika ele. 16 Nání na unu agaghi-eri ọbara; i gāwusi ya n'ala dika miri. 17 I pughi iri n'ọnu-uzọ-ama-gi nile otù uzọ n'uzọ iri nke ọka-gi, na nke manya-vine ọhu gi, na nke manu-gi, ma-ọbu umu eburu uzọ mu nke ìgwè ehi-gi na nke ìgwè ewu na aturu-gi, ma-ọbu ihe ọ bula nke nkwa-gi nile nke i nēkwe, ma-ọbu onyinye-afọ-ofufo-gi nile, ma-ọbu àjà-nbuli nke aka-gi: 18 kama ọ bu n'iru Jehova, bú Chineke-gi, ka i gēri ha, n'ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na onye Livai nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula: i gāṅuri kwa ọṅu n'iru Jehova, bú Chineke-gi, na nseti aka-gi ọ bula. 19 Lezie onwe-gi anya ka i ghara irapu onye Livai ubọchi-gi nile n'elu ala-gi. 20 Mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gēme ka ókè-ala-gi sa mbara, dika Ọ gwara gi, i we si, Ka m'rie anu, n'ihi na agu nāgu nkpuru-obi-gi iri anu; n'agu nile nke nkpuru-obi-gi i gēri anu. 21 Mb͕e ọ gādikari gi anya, bú ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa itiye aha-Ya n'ebe ahu, i gēb͕u kwa ufọdu nime ìgwè ehi-gi na nime ìgwè ewu na aturu-gi, nke Jehova nyeworo gi, dika m'nyeworo gi iwu, i gēri kwa n'ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula, n'agu nile nke nkpuru-obi-gi. 22 Nání, dika anēri mb͕ada na ele, otú a ka i gēri ha: onye ruru árú na onye di ọcha gēri ha n'otù uzọ ahu. 23 Nání, di ike ka i ghara iri ọbara: n'ihi na ọbara bu ndu; eri-kwa-la ndu tiyere anu. 24 Erila ya; i gāwusi ya n'ala dika miri. 25 Erila ya; ka o we diri gi nma, di-kwa-ra umu-gi gānọchi gi, mb͕e i gēme ihe ziri ezi n'anya Jehova. 26 Nání ihe nsọ gi nile nke i nwere, na ihe-nkwa-gi nile, ka i gēbuli, biarue ebe ahu nke Jehova gārọputa: 27 i gāchu kwa aja-nsure-ọku-gi nile, anu na ọbara, n'elu ebe-ichu-àjà nke Jehova, bú Chineke-gi: agāwukwasi kwa ọbara nke àjà-gi nile n'ebe-ichu-àjà nke Jehova, bú Chineke-gi, ma i gēri anu-ha. 28 Riba okwu ndia nile ama, nu kwa ha, bú nke mu onwem nēnye gi n'iwu, ka ọ we diri gi nma, di-kwa-ra umu-gi gānọchi gi rue mb͕e ebighi-ebi, mb͕e i nēme ihe di nma nke ziri ezi n'anya Jehova, bú Chineke-gi. 29 Mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gēbipu mba nile n'iru gi, ebe i nābà nime inweta ha, i we nweta ha, biri n'ala-ha; 30 gi lezie onwe-gi anya ka aghara ima gi n'ọnyà iso ha n'azu, mb͕e ekpochapusiri ha n'iru gi; ka i ghara kwa iju ajuju bayere chi nile ha, si, Mba ndia si aṅa nēfè chi nile ha òfùfè? m'gēme kwa otú a, ọbuná mu onwem. 31 Emerela Jehova, bú Chineke-gi, otú a: n'ihi na ihe-árú nile nke Jehova, nke Ọ nākpọ asì, ka ha meworo chi-ha; n'ihi na ọbuná umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom ka ha nēsurere chi-ha n'ọku. 32 Ihe ọ bula nke mu onwem nēnye unu n'iwu, nke ahu ka unu gēlezi anya ime: atukwasila ihe n'elu ya, agubì-kwa-la ihe nime ya.

Deuteronomi 13

1 Mb͕e onye-amuma ma-ọbu ọrọ-nrọ gēbili n'etiti gi, nye gi ihe-iriba-ama ma-ọbu ihe-ebube, 2 ihe-iriba-ama ahu ma-ọbu ihe-ebube ahu we me, nke ọ gwara gi okwu bayere ya, si, Ka ayi jeso chi ọzọ n'azu, (nke ọ nādighi mb͕e i mara ha), ka ayi fè kwa ha òfùfè; 3 egela nti okwu onye-amuma ahu, ma-ọbu ọrọ-nrọ ahu: n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, nānwà unu, ima ma unu nēwere obi-unu nile na nkpuru-obi-unu nile hu Jehova, bú Chineke-unu, n'anya. 4 Jehova, bú Chineke-unu, ka unu ganējeso n'azu, Ya ka unu gātu egwu, ihe nile O nyere n'iwu ka unu gēdebe, olu-Ya ka unu gēge nti, Ya ka unu gēfè òfùfè, Ya ka unu gārapara n'aru. 5 Ma agēme ka onye-amuma ahu, ma-ọbu ọrọ-nrọ ahu, nwua; n'ihi na o kwuworo okwu nwezuga megide Jehova, bú Chineke-unu, (Onye nēme ka unu si n'ala Ijipt puta, Onye nāb͕aputa kwa gi n'ulo ndi-orù), ka o we duhie gi n'uzọ ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi n'iwu ije ije nime ya. I we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi. 6 Mb͕e nwa-nne-gi nwoke, bú nwa nke nne-gi, ma-ọbu nwa-gi nwoke, ma-ọbu nwa-gi nwayi, ma-ọbu nwunye nke obi-gi, ma-ọbu eyì-gi, nke di ka nkpuru-obi-gi, gārafu gi na nzuzo, si, Ka ayi je fè chi ọzọ, (nke ọ nādighi mb͕e i mara ha, gi onwe-gi, ma-ọbu nna-gi-hà; 7 ndi sitere na chi nile nke ndi nile nọ unu buruburu, ndi nọ nso gi, ma-ọbu ndi nọpuru gi n'ebe di anya, site n'otù nsọtu uwa we rue nsọtu ọzọ nke uwa); 8 ekwela ya, ege-kwa-la ya nti; anya-gi agaghi-emere ya ebere, enwe-kwa-la ọmiko n'aru ya, ekpuchi-kwa-la ya: 9 kama i ghaghi ib͕u ya; aka-gi gēbu uzọ dikwasi ya ime ka ọ nwua, ma aka ndi Israel nile gādikwasi ya n'ikpe-azu. 10 I gēwere nkume tub͕ue ya, ka o we nwua; n'ihi na ọ chọwo iduhie gi n'akuku Jehova, bú Chineke-gi, Onye nēme ka i si n'ala Ijipt, si kwa n'ulo ndi-orù, puta. 11 Israel nile gānu kwa, we tua egwu, ha agaghi-eme kwa ọzọ dika ihe ọjọ a si di n'etiti gi. 12 Mb͕e i gānu okwu n'otù nime obodo-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ibi n'ebe ahu, si, 13 Ndikom ufọdu, ndi jọb͕uru onwe-ha, esiwo n'etiti gi pua, we duhie ndi bi n'obodo-ha, si, Ka ayi je fè chi ọzọ òfùfè, (nke ọ nādighi mb͕e unu mara ha); 14 i gāju kwa ase, gwu ala-ya, juta nke-ọma; ma, le, asi na ọ bu ezi-okwu, okwu ahu eguzosi ike, na emewo ihe-árú ahu n'etiti gi; 15 i ghaghi iwere ọnu mma-agha tib͕ue ndi bi n'obodo ahu, were mma-agha wezuga ya, na ihe nile di nime ya, na anu-ulo-ya, ka ebibie ya. 16 I gākwakọba kwa ihe-nkwata-ya nile n'etiti amá-ya, sure-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, obodo ahu na ihe-nkwata-ya nile dum n'ọku: ọ gābu kwa obo mb͕e ebighi-ebi; agaghi-ewu ya ọzọ. 17 Ọ dighi kwa ihe ọ bula site n'ihe ahu ewezugara ka ebibie ya gārapara n'aka-gi: ka Jehova we si n'idi-ọku nke iwe-Ya chigharia, gosi gi obi-ebere, nwe obi-ebere n'aru gi, me ka i ba uba, dika Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi; 18 mb͕e i gēge kwa olu Jehova, bú Chineke-gi, nti, idebe ihe nile Ọ nyere n'iwu nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, ka i we me ihe ziri ezi n'anya Jehova, bú Chineke-gi.

Deuteronomi 14

1 Unu onwe-unu buru Jehova, bú Chineke-unu, umu: unu ebìla onwe-unu mma, unu eme-kwa-la isi-nkwọcha n'etiti anya-unu abua n'ihi onye nwuru anwu. 2 N'ihi na ndi nsọ ka i buru Jehova, bú Chineke-gi, ọ bu kwa gi ka Jehova rọputaworo iburu Ya ihe nke aka Ya, kari ndi nile ndi nọ n'elu ala. 3 Erila ihe-árú ọ bula. 4 Ndia bu anumanu nke unu gēri: ehi, na aturu, na ewu, 5 na ele, na mb͕ada, na ob͕o-miri, na ewu ọhia, na atu, na anigọ, na uturu. 6 Anumanu ọ bula nke ukwu-ya wara njakpa, nke ukwu-ya wara-kwa-ra awara abua, nke nātaghari kwa ọnu, n'etiti anumanu, nke ahu ka unu gēri. 7 Otú ọ di, ndia ka unu nāgaghi-eri n'etiti ihe nātaghari ọnu, ma-ọbu n'etiti ndi ukwu-ha wara njakpa: camel, na hare, na coney, n'ihi na ihe nātaghari ọnu ka ha bu, ma ha abughi ihe ukwu wara njakpa, ihe ruru árú ka ha buru unu: 8 ezì kwa, n'ihi na ihe ukwu-ya wara njakpa ka ọ bu, ma ọ bughi ihe nātaghari ọnu, ihe ruru árú ka ọ buru unu: unu erila ihe sitere n'anu-ha, unu emetu-kwa-la ozu-ha aka. 9 Ndia ka unu gēri n'etiti ihe nile nke di na miri: ihe ọ bula nke nwere ntù na akpilikpa ka unu gēri: 10 ma ihe ọ bula nke nēnweghi ntù na akpilikpa, unu erila ya; ihe-árú ka ọ buru unu. 11 Nnunu ọ bula nke di ọcha ka unu gēri. 12 Ma ndia bu nnunu unu agaghi-eri ihe sitere n'anu-ha: ugo, na ugo-agwọ, na ugo-azù; 13 na udele, na agu-nkwọ, na ndab͕u di iche iche; 14 na ugolo-ọma ọ bula di iche iche; 15 na enyi-nnunu, na eb͕e-abali, na nnunu oké osimiri, na eb͕e di iche iche; 16 na okwukwu ntà, na okwukwu uku, na okwukwu nwere mpi; 17 na okwolo, na udele, na cormorant; 18 na ub͕ala, na utù di iche iche, na hoopoe, na usu. 19 Anu-ufe ọ bula nke nēnuputa enuputa, ihe-árú ka ọ buru unu; agaghi-eri ha. 20 Anu-ufe ọ bula nke di ọcha ka unu gēri. 21 Unu erila ihe nwuru onwe-ya: ọ bu ọbìa nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula ka i gēnye ya, ka ọ we rie ya; ma-ọbu i gērenye ya onye ala ọzọ: n'ihi na ndi nsọ ka i buru Jehova, bú Chineke-gi. Esila nwa-ewu nime miri-ara nke nne-ya. 22 I ghaghi inye otù uzọ n'uzọ iri nke ihe-ọmume nile nke nkpuru-gi, bú ihe nke nēsi n'ubi-gi puta kwa-arọ. 23 I gēri kwa ihe n'iru Jehova, bú Chineke-gi, n'ebe ahu nke Ọ gārọputa ime ka aha-Ya biri n'ebe ahu, bú otù uzọ n'uzọ iri nke ọka-gi, na nke manya-vine ọhu gi, na nke manu-gi, na umu eburu uzọ mu nke ìgwè ehi-gi na nke ìgwè ewu na aturu-gi; ka i we muta itu egwu Jehova, bú Chineke-gi, ubọchi-gi nile. 24 Ma mb͕e uzọ ahu gādikari gi anya, i we ghara ipu ibū ya, n'ihi na ebe ahu dipuru anya n'ebe i nọ, bú ebe nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa itiye aha-Ya n'ebe ahu, mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gāgọzi gi: 25 i gēnye kwa ya n'ego, ke ego ahu n'aka-gi, jerue ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa: 26 i gēnye kwa ego ahu n'ihe ọ bula nke agu ya nāgu nkpuru-obi-gi, n'ìgwè ehi, ma-ọbu n'ìgwè ewu na aturu, ma-ọbu na manya-vine, ma-ọbu n'ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, ma-ọbu n'ihe ọ bula nkpuru-obi-gi nāriọ n'aka-gi: i gēri kwa ihe n'ebe ahu n'iru Jehova, bú Chineke-gi, ṅuri kwa ọṅu, gi onwe-gi na ulo-gi: 27 ma onye Livai nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula, arapula ya; n'ihi na ọ dighi òkè ma-ọbu ihe-nketa o soro gi nwe. 28 N'ọgwugwu arọ atọ i gēweputa otù uzọ n'uzọ iri nile nke ihe-ọmume-gi n'otù arọ ahu, dọba kwa ya nime ọnu-uzọ-ama-gi nile: 29 onye Livai gābia kwa, (n'ihi na ọ dighi òkè ma-ọbu ihe-nketa o soro gi nwe), ya na ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ndi nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, ha gēri kwa ihe, afọ gēju kwa ha; ka Jehova, bú Chineke-gi, we gọzie gi n'omume nile nke aka-gi nke i nēme.

Deuteronomi 15

1 N'ọgwugwu arọ asa i gēme nrapu. 2 Nka bu kwa okwu nrapu ahu: onye-nbinye ọ bula gārapu ihe nke o nēbinye ab͕ata-obi-ya; ọ gaghi-eji ab͕ata-obi-ya na nwa-nne-ya n'ihe-ike; n'ihi na akpọsara nrapu nye Jehova. 3 Onye ala ọzọ ka i gēji n'ihe-ike: ma ihe ọ bula i nwere nke di n'aka nwa-nne-gi, aka-gi gārapu ya; 4 ma-ọbughi mb͕e ob͕eye nādighi n'etiti gi; (n'ihi na Jehova aghaghi igọzi gi n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi dika ihe-nketa ka i we nweta ya; ) 5 nání ọ buru na i ge nti olu Jehova, bú Chineke-gi, nke-ọma, ilezi anya ime ihe nile a enyere n'iwu nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta. 6 N'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, gāgọzi gi, dika Ọ gwara gi okwu: i gānara kwa ọtutu mba ihe-ibe, ma gi onwe-gi agaghi-ab͕a ihe n'ibe; i gāchi kwa ọtutu mba, ma ha agaghi-achi gi. 7 Mb͕e ob͕eye di n'etiti gi, bú otù onye n'etiti umu-nne-gi, n'otù nime ọnu-uzọ-ama-gi nile n'ala-gi nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, ab͕ala obi-gi ume, akwukwubala aka-gi n'ebe nwa-nne-gi, bú ob͕eye, nọ: 8 kama i ghaghi isaghere ya aka-gi, i ghaghi kwa inye ya ihe gēzuru ukọ-ya nke kọrọ ya n'ọnọdu ihe-ibe-ya. 9 Lezie onwe-gi anya ka okwu nke jọb͕uru onwe-ya ghara idi n'obi-gi, si, Arọ nke-asa, bú arọ nrapu, di nso; anya-gi we jọ njọ n'aru nwa-nne-gi, bú ob͕eye, i we ghara inye ya ihe; o we kpọkue Jehova megide gi, o we buru nmehie nime gi. 10 I ghaghi inye ya, ọ gaghi-ajọ-kwa-ra obi-gi njọ mb͕e i nēnye ya: n'ihi na ọ bu n'ihi ihe a ka Jehova, bú Chineke-gi, gāgọzi gi n'omume-gi nile, na nime nseti aka-gi nile. 11 N'ihi na ndi-ob͕eye agaghi-agwupu n'etiti ala: n'ihi nka ka mu onwem nēnye gi iwu, si, I ghaghi isaghere nwa-nne-gi aka-gi, saghere onye nke gi ewedara n'ala, saghe-kwa-ra ob͕eye nke gi, n'ala-gi. 12 Mb͕e agērenye gi nwa-nne-gi, bú nwoke Hibru, ma-ọbu nwayi Hibru, o we fè gi òfùfè arọ isi; n'arọ nke-asa i gēzipu ya n'ebe i nọ ka o nwere onwe-ya. 13 Ma mb͕e i nēzipu ya n'ebe i nọ ka o nwere onwe-ya, ezipula ya n'aka efu: 14 i gēsi n'ìgwè ewu na aturu-gi, si kwa n'ebe-nzọcha-ọka-gi, si kwa n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine-gi, nyebiga ya okè; ihe nke Jehova, bú Chineke-gi, ji gọzie gi ka i gēnye ya. 15 I gēcheta kwa na ọ bu orù ka i buri n'ala Ijipt, ma Jehova, bú Chineke-gi, b͕aputara gi: n'ihi ya ka mu onwem nēnye gi ihe a n'iwu ta. 16 Ọ gēru kwa, mb͕e ọ gāsi gi, M'gaghi-apu n'ebe i nọ; n'ihi na ọ nāhu gi na ulo-gi n'anya, n'ihi na ọ diri ya nma n'ebe i nọ; 17 i gēwere kwa arà, rapue nti-ya na ọnu-uzọ, ọ gābu-kwa-ra gi orù mb͕e ebighi-ebi. Ọ bu kwa otú a ka i gēmere orù-gi nwayi. 18 Ọ gaghi-adi ike n'anya-gi, mb͕e i nēzipu ya n'ebe i nọ ka o nwere onwe-ya; n'ihi na okpukpu ugwọ-ọlu nke onye egoro ọlu ka o fèworo gi òfùfè arọ isi: Jehova, bú Chineke-gi, gāgọzi kwa gi n'ihe nile nke i nēme. 19 Nwa ọ bula, bú oké, nke eburu uzọ mu, nke agāmu nime ìgwè ehi-gi na nime ìgwè ewu na aturu-gi, i gēdoro ya Jehova, bú Chineke-gi, nsọ: ejila nwa nke ehi-gi buru uzọ mu lu ọlu-ubi, akpacha-kwa-la aji nke nwa eburu uzọ mu nke ìgwè ewu na aturu-gi. 20 N'iru Jehova, bú Chineke-gi, ka i gēri ya kwa-arọ n'ebe ahu nke Jehova gārọputa, gi onwe-gi na ulo-gi. 21 Ma mb͕e ọlu di n'aru-ya, dika ngwurọ ma-ọbu ìsì, ọlu ọ bula nke jọrọ njọ, achurula ya Jehova, bú Chineke-gi. 22 Nime ọnu-uzọ-ama-gi nile ka i gēri ya: onye ruru árú na onye di ọcha n'otù uzọ ahu, dika mb͕ada, na dika ele. 23 Nání na i gaghi-eri ọbara-ya; i gāwusi ya n'ala dika miri.

Deuteronomi 16

1 Debe ọnwa Ebib, me-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, ememe ngabiga: n'ihi na ọ bu n'ọnwa Ebib ka Jehova, bú Chineke-gi, mere ka i si n'Ijipt puta n'abali. 2 I gāchu-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, àjà ngabiga, nke ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, n'ebe ahu nke Jehova gārọputa ime ka aha-Ya biri n'ebe ahu. 3 Erila achicha koro eko tiyere ya; ubọchi asa ka i gēri achicha ekoghi-eko tiyere ya, bú achicha nweda-n'ala; n'ihi na i mere ngwa ngwa si n'ala Ijipt puta: ka i we nēcheta ubọchi ahu mb͕e i siri n'ala Ijipt puta ubọchi nile nke ndu-gi. 4 Agaghi-ahu kwa ihe nēko achicha n'aka-gi n'ókè-ala-gi nile ubọchi asa; ọ dighi kwa ihe ọ bula nime anu ahu, nke i nāchu n'àjà n'anyasi n'ubọchi mbu, gādigide abali nile rue ututu. 5 I pughi ichu àjà ngabiga n'otù nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi: 6 kama n'ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa ime ka aha-Ya biri nime ya, n'ebe ahu ka i gāchu àjà ngabiga n'anyasi, mb͕e anyanwu nāda, na mb͕e akara àkà mb͕e i siri n'Ijipt puta. 7 I gēsi kwa ya rie ya n'ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa: i gēchighari kwa n'ututu, je n'ulo-ikwu-gi nile. 8 Ubọchi isi ka i gēri achicha ekoghi-eko: n'ubọchi nke-asa ubọchi nb͕ochi gādiri Jehova, bú Chineke-gi; ejela ozi nime ya. 9 Izù asa nke ubọchi asa ka i gāguru onwe-gi: site na mb͕e i nāmalite itiye mma-iwe-ihe-ubi nime ọka guzoro eguzo ka i gāmalite igu izù asa nke ubọchi asa. 10 I gēme-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, ememe nke izù asa nke ubọchi asa, dika ọtùtù nke onyinye-afọ-ofufo nke aka-gi si di, nke i gēnye, dika Jehova, bú Chineke-gi, nāgọzi gi: 11 i gāṅuri kwa ọṅu n'iru Jehova, bú Chineke-gi, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na onye Livai nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, na ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ndi nọ n'etiti gi, n'ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa ime ka aha-Ya biri n'ebe ahu. 12 I gēcheta kwa na ọ bu orù ka i buri n'Ijipt: i gēdebe kwa me kwa ukpuru ndia. 13 I gēmere onwe-gi ememe ulo-ntu ubọchi asa, mb͕e i chikọtasiri ihe sitere n'ebe-nzọcha-ọka-gi na n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine-gi: 14 i gāṅuri kwa ọṅu n'ememe-gi, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na onye Livai, na ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ndi nọ n'ọnu-uzọ-ama-gi nile. 15 Ubọchi asa ka i gēmere Jehova, bú Chineke-gi, ememe n'ebe ahu nke Jehova gārọputa: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, gāgọzi gi n'ihe-ọmume-gi nile, na n'omume nile nke aka-gi, i gābu kwa onye nāṅuri nání ọṅu. 16 Ub͕ò atọ n'arọ ka agāhu ndikom-i nile n'iru Jehova, bú Chineke-gi, n'ebe ahu nke Ọ gārọputa; n'ememe achicha ekoghi-eko, na n'ememe nke izù asa nke ubọchi asa, na n'ememe ulo-ntu: agaghi-ahu kwa ha n'iru Jehova n'aka efu: 17 nwoke ọ bula dika onyinye aka-ya si di, dika ngọzi Jehova, bú Chineke-gi, si di, nke O nyeworo gi. 18 I gēmere onwe-gi ndi-ikpé na ndi-odozi-okwu nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, dika ebo-gi nile si di: ha gēkpe kwa ndi Israel ikpe ezi omume. 19 Ewezugala ikpé; amatala iru madu n'ikpé: anara-kwa-la ihe-iri-ngo; n'ihi na ihe-iri-ngo nēme ka anya ndi mara ihe kpu ìsì, ọ nēme kwa ka okwu nile nke ndi ezi omume b͕agọ ab͕agọ. 20 Ezi omume, ezi omume ka i gāb͕aso, ka i we di ndu, we nweta ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi. 21 Akurula onwe-gi Ashera nke osisi ọ bula n'akuku ebe-ichu-àjà nke Jehova, bú Chineke-gi, nke i gēmere onwe-gi. 22 Eguzoro-kwa-la onwe-gi ogidi; nke Jehova, bú Chineke-gi, nākpọ asì.

Deuteronomi 17

1 Achurula Jehova, bú Chineke-gi, ehi, ma-ọbu aturu, nke ọlu di n'aru-ya, bú ihe ọjọ ọ bula: n'ihi na ihe-árú nke Jehova, bú Chineke-gi, ka ọ bu. 2 Mb͕e agāhuta n'etiti gi, n'otù nime ọnu-uzọ-ama-gi nile nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, nwoke ma-ọbu nwayi, nke nēme ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, bú Chineke-gi, n'igabiga ọb͕ub͕a-ndu-Ya, 3 nke jewo-kwa-ra fè chi ọ bula ọzọ òfùfè, we kpọ isi ala nye ha, ma-ọbu inye anyanwu, ma-ọbu inye ọnwa, ma-ọbu inye ihe ọ bula nime usu ihe elu-igwe, nke m'nēnyeghi n'iwu; 4 ewe gosi gi ya, i we nu ya, i gāju kwa ase nke-ọma, ma, le asi na ọ bu ezi-okwu, okwu ahu eguzosi ike, na emewo ihe-árú ahu n'Israel; 5 i gēme kwa ka nwoke ahu ma-ọbu nwayi ahu puta, bú ndi meworo ihe ọjọ a, rue ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula, ọbuná nwoke ahu ma-ọbu nwayi ahu; i gēwere nkume tub͕ue ha, ka ha nwua. 6 N'ọnu ndi-àmà abua, ma-ọbu ndi-àmà atọ, ka agēme ka ọ nwua, bú onye gānwu anwu; agaghi-eme ka ọ nwua n'ọnu otù onye-àmà. 7 Aka ndi-àmà gēbu uzọ dikwasi ya ime ka ọ nwua, ma aka ndi Israel nile gādikwasi ya n'ikpe-azu. I we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi. 8 Mb͕e okwu ọ bula gākari gi n'ikpé, n'etiti ọbara na ọbara, ma-ọbu n'etiti okwu-ikpé na okwu-ikpé, ma-ọbu n'etiti otiti-ihe na otiti-ihe, bú okwu nile nke ise-okwu nime ọnu-uzọ-ama-gi nile: i gēbili kwa, rigorue ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa; 9 i gābiakute kwa ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, biakute kwa onye-ikpe nke gānọ na mb͕e ahu: i gāju kwa ase; ha gēgosi kwa gi uzọ ikpe ikpe ahu: 10 i gēme kwa dika okwu ahu si di, nke ha gēgosi gi site n'ebe ahu nke Jehova gārọputa; i gēlezi kwa anya ime dika ihe nile si di nke ha gēzí gi: 11 dika iwu ahu si di nke ha gēzí gi, na dika ikpé ahu si di nke ha gāgwa gi, otú a ka i gēme; ewezugala onwe-gi pua n'okwu ahu ha gēgosi gi, n'aka-nri, ma-ọbu n'aka-ekpe. 12 Ma nwoke ahu nke nēme nganga, n'egeghi nti onye-nchu-àjà ahu nke nēguzo ije ozi n'ebe ahu n'iru Jehova, bú Chineke-gi, ma-ọbu n'egeghi nti onye-ikpe ahu, nwoke ahu gānwu kwa: i gēkpochapu kwa ihe ọjọ ahu n'Israel. 13 Ndi Israel nile gānu kwa, tu kwa egwu, we ghara ime nganga ọzọ. 14 Mb͕e i gābà n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, i we nweta ya, biri nime ya, si, M'gēdo eze ka ọ buru ezem, dika mba nile si eme ndi dim buruburu; 15 i ghaghi ido onye ahu, onye Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa, ka ọ buru eze-gi: otù onye n'etiti umu-nne-gi ka i gēdo eze-gi: i pughi ido nwoke ala ọzọ eze-gi, nke nābughi nwa-nne-gi. 16 Nání na ọ gaghi-eme ka inyinya bara ya uba, ọ gaghi-eme kwa ndi Israel ka ha laghachi n'Ijipt, ka o we me ka inyinya ba uba: n'ihi na Jehova asiwo unu, Unu alaghachi-kwa-la n'uzọ ahu ọzọ. 17 Ọ gaghi-eme kwa ka ndinyom bara ya uba, ka obi-ya we ghara iwezuga onwe-ya: ọ gaghi-eme kwa ka ọla-ọcha na ọla-edo bara ya uba nke-uku. 18 Ọ gēru kwa, mb͕e ọ nānọkwasi n'oche-eze nke ala-eze-ya, na ọ gēdeputara onwe-ya iwu a n'akwukwọ, site n'akwokwọ ahu nke di n'iru ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai: 19 ọ gādi kwa n'aka-ya, ọ gāgu kwa ihe di nime ya ubọchi nile nke ndu-ya: ka o we muta itu egwu Jehova, bú Chineke-ya, idebe okwu nile nke iwu a na ukpuru ndia, ime ha: 20 ka obi-ya we ghara idi elu kari umu-nne-ya, ka ọ ghara kwa isi n'ihe enyere n'iwu wezuga onwe-ya, n'aka-nri, ma-ọbu n'aka-ekpe: ka o we me ka ubọchi-ya di anya n'ala-eze-ya, ya onwe-ya na umu-ya, n'etiti Israel.

Deuteronomi 18

1 Ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, bú ebo Livai nile, ọ dighi òkè ma-ọbu ihe-nketa ha gēsoro Israel nwe: àjà-ọku nile nke Jehova na ihe-nketa-Ya ka ha gēri. 2 Ọ dighi kwa ihe-nketa ha gēnwe n'etiti umu-nne-ha: Jehova onwe-ya bu ihe-nketa-ha, dika Ọ gwaworo ha. 3 Nka bu kwa ihe ekpeziri ka enye ndi-nchu-àjà site n'aka ndi Israel, bú site n'aka ndi nāchu àjà, ma ọ bu ehi-ma-ọbu aturu, na ha gēnye onye-nchu-àjà ọkwa-aka-ya, na ǹtì-ya abua, na okwurù-ya. 4 Ihe mbu nke ọka-gi, na nke manya-vine ọhu gi, na nke manu-gi, na ihe mbu nke aji ìgwè ewu na aturu-gi, ka i gēnye ya. 5 N'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, arọputawo ya n'ebo-gi nile, iguzo ije ozi n'aha Jehova, ya onwe-ya na umu-ya ndikom ubọchi-gi nile. 6 Mb͕e onye Livai gābia site n'otù nime ọnu-uzọ-ama-gi nile site n'Israel nile, ebe ya onwe-ya nọ dika ọbìa, ọ we were agu nile nāgu nkpuru-obi-ya biarue ebe ahu nke Jehova gārọputa; 7 ọ gēje kwa ozi n'aha Jehova, bú Chineke-ya, dika umu-nne-ya nile, bú ndi Livai, ndi nēguzo n'ebe ahu n'iru Jehova. 8 Òkè dika òkè-ya ka ha gēri, nāgughi ihe-ya nile erere nke o nwetara n'aka nna-ya-hà. 9 Mb͕e gi onwe-gi nābà n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, amutala ime dika ihe-árú nile nke mba ahu nile si di. 10 Agaghi-ahuta n'etiti gi onye nēme ka nwa-ya nwoke ma-ọbu nwa-ya nwayi gabiga nime ọku, ma-ọbu onye nāju ase, ma-ọbu onye nēji igwe-oji tu isi ọma ma-ọbu isi ọjọ, ma-ọbu onye nāb͕a afa, ma-ọbu onye-mb͕asi, 11 ma-ọbu dibia nrafu, ma-ọbu onye nāju mọ ihe, ma-ọbu dibia-afa, ma-ọbu onye nāju ndi nwuru anwu ihe. 12 N'ihi na ihe-árú nke Jehova ka onye ọ bula nke nēme ihe ndia bu: ọ bu kwa n'ihi ihe-árú ndia ka Jehova, bú Chineke-gi, nānapu ha ala-ha n'iru gi. 13 Onye zuru okè ka i gābu n'ebe Jehova, bú Chineke-gi, nọ. 14 N'ihi na mba ndia, nke gi onwe-gi gēnweta, nēge nti ndi nēji igwe-oji tu isi ọma ma-ọbu isi ọjọ, na ndi nāju ase: ma gi onwe-gi, ọ bughi otú a ka Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi. 15 Jehova, bú Chineke-gi, gēme ka onye-amuma, nke di ka mu onwem, biliere gi site n'etiti gi, site n'umu-nne-gi; onye ahu ka unu gēge nti; 16 dika ihe nile si di nke i riọrọ n'aka Jehova, bú Chineke-gi, na Horeb n'ubọchi nkpọkọta ahu, si, Ka m'ghara inu kwa olu Jehova, bú Chinekem, ọzọ, ka m'ghara kwa ihu ọku uku a ọzọ, ka m'we ghara inwu. 17 Jehova we sim, Ha ekwuwo nke-ọma okwu nke ha kwuworo. 18 M'gēme ka onye-amuma, nke di ka gi, biliere ha site n'etiti umu-nne-ha; M'gētiye kwa okwum nile n'ọnu-ya, ọ gāgwa kwa ha okwu nile nke M'gēnye ya n'iwu. 19 O gēru kwa, na nwoke ọ bula nke nāgaghi-ege nti okwum nile nke ọ gēkwu n'aham, Mu onwem gājuta ya n'aka ya. 20 Ma onye-amuma nke gēwere nganga kwu okwu n'aham, nke M'nēnyeghi ya iwu ikwu, ma-ọbu nke gēkwu n'aha chi di iche iche ọzọ, onye-amuma ahu gānwu kwa. 21 Mb͕e i gāsi n'obi-gi, Àyi gēsi aṅa mara okwu ahu nke Jehova nēkwughi? 22 Okwu nke onye-amuma nēkwu n'aha Jehova, ma okwu ahu emeghi, o reghi kwa; nke ahu bu okwu nke Jehova nēkwugh: na nganga ka onye-amuma ahu kwuworo ya, atula ujọ ya.

Deuteronomi 19

1 Mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gēbipu mba ahu, ndi Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ala-ha, i we napu ha ala-ha, we biri n'obodo nile ha, na n'ulo nile ha; 2 i gākpaputara onwe-gi obodo atọ n'etiti ala-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, ka i we nweta ya. 3 I gēdoziri onwe-gi uzọ, kè kwa ókè-ala nke ala-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēme gi ka i keta, uzọ atọ, ka ob͕u-madu ọ bula we b͕alaga n'ebe ahu. 4 Nka bu kwa okwu bayere ob͕u-madu, nke gāb͕alaga n'ebe ahu, we di ndu: onye nēb͕u madu-ibe-ya n'amaghi-ama, ma ya onwe-ya akpọghi ya asì na mb͕e gara aga; 5 dika mb͕e ya na ibe-ya nābà n'oké ọhia ikpọwa nkú, aka-ya we fé anyu-ike ib͕utu osisi, anyu-ike, bú ígwè, we b͕upu n'osisi ahu, we rue madu-ibe-ya aru, o we nwua; onye ahu gāb͕alaga n'otù nime obodo ndia, we di ndu: 6 ka onye-ọ́bọ̀ ọbara we ghara ichu ob͕u-madu ahu n'azu, mb͕e obi-ya di ọku, o we rue ya aru, n'ihi na uzọ di anya, ọ we tipu ndu-ya; ma ikpe ọnwu amaghi ya, n'ihi na ọ kpọghi ya asì na mb͕e gara aga. 7 N'ihi nka ka mu onwem nēnye gi iwu, si, I gākpaputara onwe-gi obodo atọ. 8 Ọ buru kwa na Jehova, bú Chineke-gi, eme ókè-ala-gi ka ọ sa mbara, dika Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi, O we nye gi ala ahu nile nke O kwuru, si na Ọ gēnye nna-gi-hà; 9 mb͕e i gēdebe ihe nile a enyere n'iwu, bú nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, ime ya, ihu Jehova, bú Chineke-gi, n'anya, na ije ije n'uzọ-Ya nile ubọchi-gi nile; i gātukwasi-kwa-ra onwe-gi obodo atọ ọzọ n'obodo atọ ndia: 10 ka ewe ghara iwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ n'etiti ala-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka ọ buru ihe-nketa, ọbara we dikwasi gi n'isi. 11 Ma mb͕e nwoke ọ bula bu onye nākpọ madu-ibe-ya asì, o we che ya anwu, bilie megide ya, tipu ndu-ya, o we nwua; ob͕u-madu ahu we b͕alaga n'otù nime obodo ndia: 12 ndi-okenye obodo-ya gēzì kwa kpọputa ya n'ebe ahu, were ya nye n'aka onye-ọ́bọ̀ ọbara, ka o we nwua. 13 Anya-gi agaghi-emere ya ebere, ma i gēkpochapu n'Israel ọbara nke onye nēmeghi ihe ọjọ, ka o we diri gi nma. 14 Ewezugala ókè-ala ab͕ata-obi-gi, nke ndi mbu akpawo, n'ihe-nketa-gi nke i gēketa, n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka i nweta ya. 15 Nání otù onye-àmà agaghi-ebili imegide onye ọ bula bayere ajọ omume ọ bula, ma-ọbu bayere nmehie ọ bula, nime nmehie ọ bula nke ọ nēmehie: n'ọnu ndi-àmà abua, ma-ọbu n'ọnu ndi-àmà atọ, ka okwu gēguzosi ike. 16 Mb͕e onye-àmà nke ihe-ike gēbili megide onye ọ bula ib͕agide ya àmà bayere nwezuga; 17 ndikom abua ahu, ndi ise-okwu ahu diri, gēguzo n'iru Jehova, n'iru ndi-nchu-àjà na ndi-ikpé ndi gānọ na mb͕e ahu; 18 ndi-ikpé gaju kwa ase nke-ọma: ma, le, asi na onye-àmà ahu bu onye-àmà ugha, nke b͕agideworo nwa-nne-ya àmà ugha; 19 unu gēme kwa ya, dika o zubere ime nwa-nne-ya; i we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi. 20 Ndi fọduru gānu kwa, tu kwa egwu, ha agaghi-eme kwa dika ihe ọjọ a si di ọzọ n'etiti gi. 21 Anya-gi agaghi-eme ebere; ndu lara ndu, anya lara anya, ezé lara ezé, aka lara aka, ukwu lara ukwu.

Deuteronomi 20

1 Mb͕e i nāpù ibuso ndi-iro-gi agha, i we hu inyinya, na ub͕o-ala, na ndi bara uba kari gi, atula egwu ha: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi, Onye nēme ka i si n'ala Ijipt rigoputa. 2 O gēru kwa, mb͕e unu nābiaru nso agha ahu, na onye-nchu-àjà gābiaru nso gwa ndi Israel okwu, 3 si ha, Nuru, Israel, unu onwe-unu nābiaru nso agha ta imegide ndi-iro-unu: ka obi-unu ghara ilọ unu miri; unu atula egwu, unu akuja-kwa-la akuja, unu ama-kwa-la jijiji n'iru ha; 4 n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, bu onye nēso unu je, iburu unu agha megide ndi-iro-unu, ka O we zọputa unu. 5 Ndi-ọchi-agha gāgwa ndi Israel okwu, si, Ònye bu nwoke nke wuworo ulo ọhu, ma ọ kāraghi ya nye Chineke? ya je laghachi n'ulo-ya, ka ọ ghara inwu n'agha, nwoke ọzọ ewe ra ya nye Chineke. 6 Ònye bu kwa nwoke nke kuworo ubi-vine, ma ọ kēmeghi ka ọ pua na nsọ anāsọ ya? ya je laghachi n'ulo-ya, ka ọ ghara inwu n'agha, nwoke ọzọ ewe me ka ọ pua na nsọ anāsọ ya. 7 Ònye bu kwa nwoke nke kwere ilu nwayi, ma o kēkubataghi ya? ya je laghachi n'ulo-ya, ka ọ ghara inwu n'agha, nwoke ọzọ ewe kubata ya. 8 Ndi-ọchi-agha gāgwa kwa ndi Israel okwu ọzọ, si, Ònye bu nwoke nke nātu egwu, nke obi nālọ kwa ya miri? ya je laghachi n'ulo-ya, ka obi umu-nne-ya we ghara imebi dika obi-ya. 9 O gēru kwa, mb͕e ndi-ọchi-agha gwabisiri ndi Israel okwu, na ha gēme ndi-isi nke usu nile nke ndi-agha ka ha buru ndi-nlekọta nēlekọta ndi Israel. 10 Mb͕e i nābiaru nso obodo ibuso ya agha, i gākpọ kwa ya òkù udo. 11 O gēru kwa, ọ buru na ọ za gi okwu udo, meghe-kwa-ra gi uzọ-ya, ọ gēru kwa, na ndi nile anāhuta nime ya gāghọrọ gi ndi nēfè òfùfè, ha gēfè kwa gi òfùfè. 12 Ma ọ buru na ọ kweghi ka gi na ya di n'udo, kama ọ nēbuso gi agha, i gānọchigide kwa ya n'agha: 13 Jehova, bú Chineke-gi, gēnye kwa ya n'aka-gi, i gēwere kwa ọnu mma-agha tib͕ue nwoke-ya ọ bula: 14 nání na i gālutara onwe-gi ndinyom, na umu-ntakiri, na anu-ulo, na ihe nile nke di n'obodo ahu, n'agha, bú ihe-nkwata-ya nile; i gēri kwa ihe-nkwata ndi-iro-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi. 15 Otú a ka i gēme obodo nile nke dipuru gi anya nke-uku, nke nādighi nime obodo nile nke mba ndia. 16 Ma emela ka ihe ọ bula nke nēku ume di ndu site n'obodo nile nke ndi ndia nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka ha buru ihe-nketa. 17 N'ihi na i ghaghi iwezuga ka ha ebibie ha; bú ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus; dika Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi iwu: 18 ka ha we ghara izí unu ime dika ihe-árú-ha nile si di, nke ha meworo chi nile ha; unu ewe mehie megide Jehova, bú Chineke-unu. 19 Mb͕e i gānọchigide obodo n'agha ọtutu ubọchi, n'ibuso ya agha iwere ya, ebibila osisi-ya n'ifekwasi ha anyu-ike; n'ihi na ọ bu ihe sitere na ha ka i gēri, eb͕utu-kwa-la ha; n'ihi na osisi nke di n'ọhia, ọ̀ bu madu, ibà n'iru gi na nnọchigide-n'agha ahu? 20 Nání osisi nke i mara na ọ dighi osisi ihe-oriri ha bu, osisi ahu ka i gēbibi b͕utu kwa ha; i gēwu kwa ihe-nnọchigide-n'agha imegide obodo ahu nke nēbuso gi agha, rue mb͕e ọ dara.

Deuteronomi 21

1 Mb͕e agāhuta otù onye eb͕uru eb͕u ka ọ dara n'ọhia n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka i we nweta ya, ma amaghi onye tib͕uru ya: 2 ndi-okenye-gi na ndi-ikpé-gi gāputa kwa, tùrue obodo nile nke di buruburu onye ahu eb͕uru eb͕u: 3 ọ gēru kwa, na obodo ahu nke dikachasiri nso onye ahu eb͕uru eb͕u, ndi-okenye obodo ahu gēwere kwa nwa-ab͕ọghọ-ehi nke ìgwè ehi, nke akējighi ya lu ọlu-ubi, nke akādọghi kwa ihe nime yoke; 4 ndi-okenye obodo ahu gākpudata nwa-ab͕ọghọ-ehi ahu nime ndagwurugwu miri nērù mbe nile, nke anālughi ọlu-ubi, nke anāghaghi kwa nkpuru nime ya, ha gāb͕aji kwa olu nwa-ab͕ọghọ-ehi ahu n'ebe ahu nime ndagwurugwu ahu: 5 ndi-nchu-àjà, bú umu Livai, gābiaru kwa nso; n'ihi na ha ka Jehova, bú Chineke-gi, rọputaworo ijere Ya ozi, na igọzi n'aha Jehova; ọ bu kwa dika okwu-ọnu-ha si di ka ise-okwu ọ bula na otiti-ihe ọ bula gādi: 6 ndi-okenye nile nke obodo ahu, ndi nọkachasiri nso onye ahu eb͕uru eb͕u, gākwọ kwa aka-ha n'elu nwa-ab͕ọghọ-ehi ahu nke ab͕ajiri olu-ya nime ndagwurugwu ahu. 7 Ha gāza kwa, si, Aka-ayi awusighi ọbara nka, anya-ayi ahughi kwa ya. 8 Jehova, kpuchiere ndi-Gi nmehie-ha, bú Israel, nke I b͕aputaworo, ekwela ka ọbara nke nēmeghi ihe ọjọ di n'etiti ndi-Gi, bú Israel. Agēkpuchi-kwa-ra ha nmehie ọbara ahu. 9 Gi onwe-gi gēkpochapu kwa n'etiti gi ọbara nēmeghi ihe ọjọ, mb͕e i gēme ihe ziri ezi n'anya Jehova. 10 Mb͕e i nāpu ibuso ndi-iro-gi agha, Jehova, bú Chineke-gi, we nye ha n'aka-gi, i we dọta usu ndi-ha adọtara n'agha n'agha, 11 i we hu nwayi nke mara nma n'aru n'usu ndi adọtara n'agha, ihe-ya we di gi ezi utọ, i we lutara ya onwe-gi na nwunye; 12 i gēme kwa ka ọ bata n'etiti ulo-gi; ọ gākọpu kwa isi-ya, mezie mbọ-aka-ya, 13 yipu uwe ndọta-n'agha-ya n'aru ya, nọdu n'ulo-gi, kwara nna-ya na nne-ya ogologo otù ọnwa: emesia i gābakuru ya, we ghọrọ ya di, ọ we ghọrọ gi nwunye. 14 O gēru kwa, ọ buru na ihe-ya atọghi gi utọ, na i gēzipu ya dika nkpuru-obi-ya si achọ; ma erela ya n'ego ma-ọli, emela ya dika orù, n'ihi na i wedawo ya n'ala. 15 Mb͕e nwoke nwere ndinyom abua, ma otù nime ha bu nwayi anāhu n'anya, nke-ọzọ aburu nwayi anākpọ asì, asi kwa na ha amuworo ya umu-ndikom, ma nwayi anāhu n'anya ma nwayi anākpọ asì; ma ọkpara bu nwa nwayi anākpọ asì muru; 16 ọ gēru kwa, n'ubọchi mb͕e ọ nēme ka umu-ya ndikom keta ihe o nwere, na ọ pughi ime ka nwa-nwoke nke nwayi anāhu n'anya buru ọkpara n'iru nwa-nwoke nke nwayi anākpọ asì, bú ọkpara: 17 kama ọ gēkwe na ọkpara ka ọ bu, bú nwa-nwoke nke nwayi anākpọ asì, n'inye ya òkè abua n'ihe ọ bula ahutara n'aka-ya: n'ihi na nwa ahu bu nkpuru mbu nke ume-ya; ọ bu ya nwe ihe ekpeziri ọnọdu-ọkpara. 18 Mb͕e nwoke nwere nwa-nwoke nēwezuga onwe-ya, nānupu kwa isi, nke nāgaghi-ege nti n'olu nna-ya, na n'olu nne-ya, ha we dọ ya aka na nti, ma ọ geghi ha nti: 19 nna-ya na nne-ya gējide kwa ya aka, me ka ọ pukuru ndi-okenye obodo-ya, we rue ọnu-uzọ-ama ebe nke ya; 20 ha gāsi kwa ndi-okenye obodo-ya, Nwa-ayi nka nēwezuga onwe-ya, nānupu kwa isi, ọ dighi-ege nti n'olu-ayi; ọ bu onye-nmefu, na onye nāṅubiga manya okè. 21 Ndikom nile nke obodo-ya gēwere nkume tub͕ue ya, ka ọ we nwua: i we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi; Israel nile gānu kwa, we tua egwu. 22 Mb͕e nmehie di n'onye ọ bula, bú ihe eji ma ya ikpe ọnwu, ewe me ka ọ nwua, i we kwuba ya n'osisi; 23 ozu-ya agaghi-adigide n'elu osisi abali nile, kama i ghaghi ilì ya n'ubọchi ahu; n'ihi na ihe-nkọcha nke Chineke ka onye a kwugburu akwugbu bu; ka i ghara imeru ala-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka ọ buru ihe-nketa.

Deuteronomi 22

1 I gaghi-ahu ehi nwa-nne-gi, ma-ọbu aturu-ya, nke nāchọ ifu efu, we zopu onwe-gi n'ebe ha di: i ghaghi iwere ha nyeghachi nwa-nne-gi. 2 Ma ọ buru na nwa-nne-gi anọghi gi nso, ọ buru kwa na i maghi ya, i gēwebata kwa ya n'etiti ulo-gi, ọ gādi kwa n'aka-gi rue mb͕e nwa-nne-gi gāju ase ya, i we were ya nyeghachi ya. 3 Otú a ka i gēme-kwa-ra inyinya-ibu-ya; otú a ka i gēme-kwa-ra uwe-nb͕okwasi-ya; otú a ka i gēme-kwa-ra ihe ọ bula furu efu nke nwa-nne-gi, nke nēfunari ya, ma i hutawo ya: i pughi izo onwe-gi. 4 I gaghi-ahu inyinya-ibu nwa-nne-gi ma-ọbu ehi-ya ka ha nāda n'uzọ, we zopu onwe-gi n'ebe ha di: i ghaghi isoro ya ibuli ha elu. 5 Ihe diri nwoke agaghi-adikwasi n'aru nwayi, nwoke agaghi-eyiri kwa uwe-nb͕okwasi nwayi: n'ihi na ihe-árú nke Jehova, bú Chineke-gi, ka onye ọ bula bu nke nēme ihe ndia. 6 Mb͕e akwu nnunu di n'iru gi n'uzọ, n'osisi ọ bula, ma-ọbu n'ala, umu-nnunu ma-ọbu àkwá adi kwa nime ya, nne ekpukwasi kwa umu-ya ma-ọbu àkwá-ya, ewela nne na umu-ya: 7 i ghaghi íme ka nne-nnunu la, ma umu-ya ka i gēwere n'onwe-gi; ka o we diri gi nma, ka i we me kwa ka ubọchi-gi di anya. 8 Mb͕e i nēwu ulo ọhu, i gēme-kwa-ra elu-ulo-gi ihe-nb͕ochi buruburu, ka i ghara ime ka ọbara di n'ulo-gi, mb͕e madu gēsi na ya da. 9 Aghala uzọ nkpuru abua n'ubi-vine-gi: ka ojuju nke nkpuru i nāgha na ihe-ọmume ubi-vine-gi we ghara idi nsọ. 10 Ejikọla ehi na inyinya-ibu idọ ihe eji gwu ala-ubi. 11 Eyila uwe nke eji uzọ ihe abua kpakọta, bú aji-anu na flax n'otù. 12 I gēmere onwe-gi ihe-ogho akpara akpà n'elu usọ anọ nke ihe-nb͕okwasi-gi, bú nke i ji b͕okwasi onwe-gi. 13 Mb͕e nwoke gāluru nwunye, bakuru ya, kpọ ya asì, 14 we bo ya ebubo ihere, we weta aha ọjọ n'isi ya, si, Nwayi a ka m'luru na nwunye, m'we biarue ya nso, ma achọtaghm n'aru ya ihe nēgosi na ọ bu nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke: 15 nna nwa-ab͕ọghọ ahu, na nne-ya, gēwere kwa ihe nēgosi na nwa-ab͕ọghọ ahu bu onye nāmaghi nwoke, ha gēweputa-kwa-ra ha ndi-okenye obodo, rue ọnu-uzọ-ama: 16 nna nwa-ab͕ọghọ ahu gāsi kwa ndi-okenye ahu, Nwam nwayi ka m'nyere nwoke a na nwunye, o we kpọ ya asì; 17 ma, le, nwoke a ebowo ya ebubo ihere, si, Achọtaghm n'aru nwa-gi nwayi ihe nēgosi na ọ bu nwayi nāmaghi nwoke; ma ndia bu ihe nēgosi na nwam nwayi bu nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke. Ha gāb͕asa kwa uwe-nb͕okwasi-ya n'iru ndi-okenye obodo ahu. 18 Ndi-okenye obodo ahu gēwere nwoke ahu dọ ya aka na nti; 19 ha gēri kwa ya nra ọgu shekel ọla-ọcha ise, nye nna nke nwa-ab͕ọghọ ahu, n'ihi na o wetawo aha ọjọ n'isi nwa-ab͕ọghọ nke Israel nāmaghi nwoke: ya ka ọ gābu-kwa-ra nwunye; ọ pughi ichupu ya ubọchi-ya nile. 20 Ma ọ buru na ihe a bu, ezi-okwu, na achọtaghi n'aru nwa-ab͕ọghọ ahu ihe nēgosi na ọ bu nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke: 21 ha gēme kwa ka nwa-ab͕ọghọ ahu putarue ọnu-uzọ ulo nna-ya, ndikom obodo-ya gēwere nkume tub͕ue ya ka ọ we nwua: n'ihi na o mere ihe-nzuzu n'Israel, ikwa iko n'ulo nna-ya: i we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi. 22 Mb͕e agāhuta nwoke ka ya na nwayi nēdina, bú nwayi nke di lutaworo, ha abua gānwu kwa, bú nwoke ahu nke ya na nwayi ahu nēdina, na nwayi ahu: i we kpochapu ihe ọjọ ahu n'Israel. 23 Mb͕e nwa-ab͕ọghọ di nke bu nwayi nāmaghi nwoke, nke nwoke kwere ilu, ma nwoke hutara ya n'obodo, we soro ya dina; 24 unu gēme kwa ka ha abua putarue ọnu-uzọ-ama obodo ahu, unu gēwere nkume tub͕ue ha, ka ha we nwua; nwa-ab͕ọghọ ahu, n'ihi na o tighi nkpu n'obodo: na nwoke ahu, n'ihi na o wedawo nwunye madu-ibe-ya n'ala: i we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi. 25 Ma ọ buru na nwoke ahu ahuta nwa-ab͕ọghọ ahu n'ọhia, bú nwayi nwoke kwere ilu, nwoke ahu ewe jigide ya n'ike, soro ya dina; ọ bu kwa nání nwoke nke soro ya dina gānwu: 26 ma ọ dighi ihe i gēmere nwa-ab͕ọghọ ahu; ọ dighi nmehie ọnwu diri nwa-ab͕ọghọ ahu: n'ihi na dika mb͕e nwoke nēbili imegide madu-ibe-ya, we b͕ue ya eb͕u, otú a ka okwu a di: 27 n'ihi na n'ọhia ka ọ hutara ya; nwa-ab͕ọghọ ahu nwoke kwere ilu tiri nkpu, ma ọ dighi onye-nzọputa o nwere. 28 Mb͕e nwoke gāhuta nwa-ab͕ọghọ nke bu nwayi nāmaghi nwoke, nke nwoke nēkweghi ilu, o we jide ya, soro ya dina, ewe huta ha; 29 nwoke ahu nke soro ya dina gēnye kwa nna nwa-ab͕ọghọ ahu ọgu shekel ọla-ọcha abua na iri, ya ka nwa-ab͕ọghọ ahu gābu-kwa-ra nwunye, n'ihi na o wedawo ya n'ala; ọ pughi ichupu ya ubọchi-ya nile. 30 Nwoke agaghi-ekuru nwunye nna-ya, ọ gaghi-ekpughe kwa uwe kpuchiri ọtọ nna-ya.

Deuteronomi 23

1 Onye emetara ọnyá site n'ichipia nkpuru-amu-ya, ma-ọbu nke ebipuru amu-ya, agaghi-abà nime nkpọkọta Jehova. 2 Nwa-iko agaghi-abà nime nkpọkọta Jehova; ọbuná ọb͕ọ nke-iri ya agaghi-abà nime nkpọkọta Jehova. 3 Onye Amon ma-ọbu onye Moab agaghi-abà nime kpọkọta Jehova, ọbuna ọb͕ọ nke-iri ha agaghi-abà nime kpọkọta Jehova rue mb͕e ebighi-ebi: 4 n'ihi na ha ejighi achicha na miri bia n'iru unu n'uzọ, mb͕e unu siri n'Ijipt puta; na n'ihi na ha gotara Belam nwa Beoa imegide gi site na Petoa nke Mesọpọtemia, ikọcha gi. 5 Ma Jehova, bú Chineke-gi, ekweghi ige Belam nti; kama Jehova, bú Chineke-gi, b͕anwere nkọcha ahu ka ọ ghọrọ gi ngọzi, n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, huru gi n'anya. 6 Achọla udo-ha na ọdi-nma-ha ubọchi-gi nile rue mb͕e ebighi-ebi. 7 Akpọla onye Edom ihe árú; n'ihi na nwa-nne-gi ka ọ bu: akpọla onye Ijipt ihe-árú; n'ihi na ọbìa ka i buri n'ala-ya. 8 Umu agāmuru ha, ọb͕ọ nke-atọ ha, gābà nime nkpọkọta Jehova. 9 Mb͕e i nāpu dika ọmuma-ulo-ikwū imegide ndi-iro-gi, i gēdebe kwa onwe-gi pua n'ihe ọjọ ọ bula. 10 Mb͕e nwoke ọ bula di n'etiti unu, nke nādighi ọcha, site n'ihe mere ya n'abali, ọ gāpu kwa je n'azu ọmuma-ulo-ikwū, ọ gaghi-abà n'etiti ọmuma-ulo-ikwū: 11 ma ọ gēru, mb͕e ọ nēru anyasi, na ọ gēwere miri sa aru-ya: mb͕e anyanwu nāda, ọ gābà kwa n'etiti ọmuma-ulo-ikwū. 12 I gēnwe kwa otù ebe n'azu ọmuma-ulo-ikwū ebe i ganāpu je n'ọgwe: 13 i gēnwe kwa osekè n'etiti ihe-agha-gi; ọ gēru kwa, mb͕e i nānọdu n'ọgwe, na i gēwere ya gwue ala, i we chigharia kpochie ihe si n'aru-gi puta: 14 n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nējeghari n'etiti ọmuma-ulo-ikwū-gi, inaputa gi, na irara ndi-iro-gi nye n'iru gi; ọmuma-ulo-ikwū-gi gādi kwa nsọ: ka O we ghara ihu n'etiti gi ọtọ ihe ọ bula, we laghachi n'iso gi n'azu. 15 Emechibidola orù nye onye-nwe-ya, bú onye naputaworo onwe-ya n'aka onye-nwe-ya b͕akute gi: 16 ọ gēbiyere gi, n'etiti gi, n'ebe ahu nke ọ gārọputa n'otù nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, n'ebe di ya nma: emela ya ihe-ike. 17 Nwayi edoro nsọ ikwa iko agaghi-adi n'etiti umu-ndinyom Israel, nwoke edoro nsọ ikwa iko agaghi-adi kwa n'etiti umu-ndikom Israel. 18 Ewebatala onyinye enyere nwayi nākwa iko, ma-ọbu ihe eretara na nkita, n'ulo Jehova, bú Chineke-gi, imezù nkwa ọ bula: n'ihi na ihe-árú nke Jehova, bú Chineke-gi, ka ha abua bu kwa. 19 Ebinyela nwa-nne-gi ihe n'uma; bú uma nke ego, ma-ọbu uma nke ihe-oriri, ma-ọbu uma nke ihe ọ bula nke anēbinye n'uma: 20 onye ala ọzọ ka i gēbinye ihe n'uma; ma ebinyela nwa-nne-gi ihe n'uma: ka Jehova, bú Chineke-gi, we gọzie gi na nseti aka-gi nile, n'elu ala ahu ebe gi onwe-gi nābà inweta ya. 21 Mb͕e i gēkwe Jehova, bú Chineke-gi, nkwa, alala azu n'ikwughachi ya: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, aghaghi iju ase ya n'aka-gi; ọ gābu kwa nmehie nime gi. 22 Ma mb͕e i ghara ikwe nkwa, ọ gaghi-abu nmehie nime gi. 23 Ihe nke nēsi n'eb͕ub͕ere-ọnu-gi puta ka i gēdebe, me kwa; dika i kweworo Jehova, bú Chineke-gi, nkwa, ọ bu onyinye-afọ-ofufo, nke i kwuworo n'ọnu-gi. 24 Mb͕e ọ bula i nābà n'ubi-vine nke ab͕ata-obi-gi, i gēri kwa nkpuru-vine, dika nkpuru-obi-gi si achọ, nke gēju gi afọ; ma etiyela nkpuru ọ bula n'ihe-gi. 25 Mb͕e ọ bula i nābà n'ọka guzoro eguzo nke ab͕ata-obi-gi, i gāghọrọ oko ọka n'aka-gi; ma ewegharila mma-iwe-ihe-ubi n'elu ọka guzoro eguzo nke ab͕ata-obi-gi.

Deuteronomi 24

1 Mb͕e nwoke gāluru nwunye, we buru di-ya, ọ gēru kwa, ọ buru na nwayi ahu ahutaghi amara n'iru ya, n'ihi na ọ huwo ihe nēkwesighi ekwesi n'aru ya, na ọ gēdere ya akwukwọ nkewa, we nye ya n'aka, we zipu ya n'ulo-ya. 2 Ma mb͕e o si n'ulo-ya pua, ọ gēje kwa buru nwunye nke nwoke ọzọ. 3 Ma asi na nwoke nke-ikpe-azu ahu akpọ ya asì, de-kwa-ra ya akwukwọ nkewa, we nye ya n'aka, we zipu ya n'ulo-ya; ma-ọbu mb͕e nwoke nke-ikpe-azu ahu gānwu, bú nke lutara ya n'onwe-ya na nwunye; 4 di mbu ya, nke zipuru ya, apughi ikpoghachi ya ọzọ iburu ya nwunye, mb͕e emerusiri ya; n'ihi na ihe-árú ka ọ bu n'iru Jehova: emela ka ala ahu mehie, bú nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ibu ihe-nketa. 5 Mb͕e nwoke gāluru nwunye ọhu, ọ gaghi-apu ba n'usu-ndi-agha, madu agaghi-agabiga rue ebe ọ nọ bayere ihe ọ bula: onye puru n'òfùfè-ala ka ọ gābu n'ulo-ya otù arọ, ọ gēme kwa ka nwunye-ya nke ọ luruworo ṅuria ọṅu. 6 Madu agaghi-ewere nkume-igwe-nri ma-ọbu aka-nkume n'ihe-ibe: n'ihi na ndu madu ka onye ahu nēwere n'ihe-ibe. 7 Mb͕e agāhu onye ọ bula ka o nēzu madu n'ori sitere n'umu-nne-ya, sitere n'umu Israel, o we nēme ya dika orù, ma-ọbu re ya; onye-ori ahu gānwu kwa: i we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi. 8 Lezie onwe-gi anya n'ihe-otiti ekpenta, ilezi anya nke-ọma, na ime dika ihe nile si di nke ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, gēzí unu: dika m'nyere ha iwu, otú a ka unu gēlezi anya ime. 9 Cheta ihe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, mere Miriam, n'uzọ, mb͕e unu siri n'Ijipt puta. 10 Mb͕e i nēbinye madu-ibe-gi ihe-nbinye ọ bula, abala n'ulo-ya iwere ihe-ibe-ya. 11 N'èzí ka i gēguzo, nwoke ahu onye gi onwe-gi nēbinye ihe gēweputa-kwa-ra gi ihe-ibe-ya n'èzí. 12 Ma ọ buru na onye ewedara n'ala ka ọ bu, ewela ihe-ibe-ya dina ala: 13 i ghaghi inyeghachi ya ihe-ibe ahu mb͕e anyanwu nāda, ka o we dina ala n'uwe-ya, we gọzie gi: o we buru gi ezi omume n'iru Jehova, bú Chineke-gi. 14 Emeb͕ula onye egoro ọlu nke bu onye ewedera n'ala na ob͕eye, ma o sitere n'umu-nne-gi, ma-ọbu na o sitere na ndi-ọbìa-gi ndi nọ n'ala-gi nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula. 15 N'ubọchi-ya ka i gēnye ya ugwọ-ọlu-ya, anyanwu agaghi-adakpu kwa ya; n'ihi na onye ewedara n'ala ka ọ bu, nke ahu ka ya onwe-ya nātukwasi kwa nkpuru-obi-ya: ka o we ghara ikpọku Jehova megide gi, o we buru nmehie nime gi. 16 Agaghi-eme ka ndi bu nna nwua n'ọnọdu umu-ha, agaghi-eme kwa ka umu nwua n'ọnọdu ndi bu nna-ha: agēme ka ha nwua, onye ọ bula nime nmehie nke aka ya. 17 Ewezugala ikpé ọbìa, bú nwa-nb͕ei; ewere-kwa-la uwe nwayi di-ya nwuru n'ihe-ibe: 18 ma i gēcheta na orù ka i buri n'Ijipt, Jehova, bú Chineke-gi, we b͕aputa gi n'ebe ahu: n'ihi nka ka m'nēnye gi iwu ime ihe a. 19 Mb͕e i nēwe ihe-ubi n'ubi-gi, i we chezọ ùkwù ọka n'ubi, ejeghachila iweta ya: ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ka ọ gādiri: ka Jehova, bú Chineke-gi, we gọzie gi n'omume aka-gi nile. 20 Mb͕e i nētisisi nkpuru osisi olive gi, eletala alaka-ya ọzọ n'azu gi: ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ka ọ gādiri. 21 Mb͕e i nāghọrọ nkpuru ubi-vine-gi, atutukọla nkpuru-ya fọduru n'azu gi: ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ka ọ gādiri. 22 I gēcheta kwa na orù ka i buri n'ala Ijipt: n'ihi nka ka m'nēnye gi iwu ime ihe a.

Deuteronomi 25

1 Mb͕e ise-okwu di n'etiti ndikom, ha we biaru nso ka ewe kpe ikpe, ndi-ikpé we kpe ha; ha gāgu kwa onye ezi omume n'onye ezi omume, gu kwa onye nēmebi iwu n'onye nēmebi iwu; 2 ọ gēru kwa, ọ buru na onye nēmebi iwu kwesiri ka etie ya ihe, na onye-ikpé gēme ka o dina ala, ka eti kwa ya ihe n'iru ya, dika nke gēzù nmebi-iwu-ya, n'ọnu-ọgugu. 3 Ọgu otiti abua ka o gēti ya, ọ gaghi-eti kari: ka ọ ghara ibu, ma asi na o gēti ya ọtutu otiti ka ndia, na agēlelì kwa nwa-nne-gi n'anya-gi. 4 Ekechila ọnu ehi mb͕e ọ nāzọcha ọka. 5 Mb͕e umu-nne ndikom gēbikọ, otù nime ha ewe nwua, ma ọ nweghi nwa-nwoke, nwunye onye ahu nke nwuru anwu agaghi-aburu nwoke ala ọzọ nwunye n'èzí: nwa-nne di-ya gābakuru ya, luru ya n'onwe-ya na nwunye, we lua ọlu kwesiri nwa-nne di n'ebe ọ nọ. 6 Ọ gēru kwa, na ọkpara ọ gāmu gānọchi n'aha nke nwa-nne-ya nke nwuru anwu, ka aghara ihichapu aha-ya n'Israel. 7 Ma ọ buru na ọ tọghi nwoke ahu iluru nwunye nwa-nne-ya na nwunye, nwunye nwa-nne-ya gārigoru ọnu-uzọ-ama, jekuru ndi-okenye, si, Nwa-nne dim nāju ime ka aha biliere nwa-nne-ya n'Israel, o kweghi ilu ọlu kwesiri nwa-nne di n'ebe m'nọ. 8 Ndi-okenye obodo-ya gākpọ kwa ya, gwa ya okwu: ma asi na o guzo, si, Ọ tọghm iluru ya na nwunye; 9 nwunye nwa-nne-ya gābiaru ya nso n'anya ndi-okenye, tọpu akpukpọ-ukwu-ya n'ukwu-ya, b͕asa ya asọ n'iru, za ya, si, Otú a ka agēme nwoke ahu nke nēwulighi ulo nwa-nne-ya. 10 Agākpọ kwa aha-ya n'Israel, Ulo nke onye atọpuru akpukpọ-ukwu-ya. 11 Mb͕e ndikom gālurita ọ̀gù, otù onye na ibe-ya, ma nwunye nke otù nime ha abiaru nso inaputa di-ya n'aka onye nēti ya ihe, asi na ọ setipu aka-ya, we jide ya na nkpa-amu-ya: 12 i gēbipu kwa aka-ya, anya-gi agaghi-eme ebere. 13 Enwela n'àkpà-gi uzọ nkume-isì-ihe abua, nke-uku na nke-ntà. 14 Enwela n'ulo-gi uzọ ephah abua, nke-uku na nke-ntà. 15 Nkume-isì-ihe zuru okè, nke zi-kwa-ra ezi, ka i gēnwe; ephah zuru okè, nke zi-kwa-ra ezi, ka i gēnwe: ka ubọchi-gi we di anya n'elu ala nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi. 16 N'ihi na ihe-árú nke Jehova, bú Chineke-gi, ka ọ bu, bu onye ọ bula nēme ihe ndia, onye ọ bula nēme ajọ omume. 17 Cheta ihe Amalek mere gi n'uzọ, mb͕e unu siri n'Ijipt puta: 18 otù o zutere gi n'uzọ, tib͕ue ndi-ikpe-azu n'etiti gi, ndi nile nādighi ike n'azu gi, mb͕e gi onwe-gi nāda #mbà, mb͕e ike gwu-kwa-ra gi; ma ọ tughi egwu Chineke. 19 O gēru kwa, mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gēmewori ka i pua n'aka ndi-iro-gi buruburu, zuru ike, n'ala nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi n'ihe-nketa, ka i we nweta ya, na i gēhichapu ncheta Amalek n'okpuru elu-igwe; echezọla.

Deuteronomi 26

1 Ọ gēru kwa, mb͕e i gābà n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi n'ihe-nketa, mb͕e i gēnweta kwa ya, we biri nime ya; 2 na i gēwere ufọdu nime nkpuru mbu nke nkpuru nile nke ala-ubi, nke i gēsi n'ala-gi nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi webata; i gētiye kwa ya n'abọ, jerue ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa ime ka aha-Ya biri n'ebe ahu. 3 I gābiakute kwa onye-nchu-àjà nke gānọ na mb͕e ahu, si ya, Egosiwom Jehova, bú Chineke-gi, ta, na abatawom n'ala ahu nke Jehova ṅuru nna-ayi-hà iyi inye ayi. 4 Onye-nchu-àjà gānara abọ ahu n'aka-gi, dọba ya n'iru ebe-ichu-àjà nke Jehova, bú Chineke-gi. 5 I gāza kwa, si n'iru Jehova, bú Chineke-gi, Onye Siria nke nāla n'iyì ka nnam bu, o we rida n'Ijipt, nọ dika ọbìa n'ebe ahu, ya na ndikom ole-na-ole; o we ghọ mba n'ebe ahu, nke di uku, di kwa ike, ba kwa uba: 6 ndi Ijipt we mejọ ayi, weda ayi n'ala, tukwasi ayi òfùfè siri ike: 7 ayi we tikue Jehova, bú Chineke nke nna-ayi-hà, Jehova we nu olu-ayi, hu kwa nweda-n'ala-ayi, na ndọb͕u ayi nādọb͕u onwe-ayi n'ọlu, na nmeb͕u-ayi: 8 Jehova we were aka di ike, na ogwe-aka esetiri eseti, na egwu uku, na ihe-iriba-ama di iche iche, na ihe-ebube di iche iche, me ka ayi si n'Ijipt puta: 9 O we me ka ayi bata n'ebe a, O we nye ayi ala nka, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya. 10 Ma ub͕u a, le, ewetawom nkpuru mbu nke nkpuru ala-ubi nke I nyeworom, Jehova. I gādọba kwa ya n'iru Jehova, bú Chineke-gi, kpọ isi ala n'iru Jehova, bú Chineke-gi: 11 i gāṅuri kwa ọṅu n'ezi ihe nile Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi, nye kwa ulo-gi, gi onwe-gi, na onye Livai, na ọbìa nke nọ n'etiti gi. 12 Mb͕e i gēnyebìwori otù uzọ n'uzọ iri nile nke ihe-ọmume-gi n'arọ nke-atọ, bú arọ nke inye otù uzọ n'uzọ iri, i gēnye kwa ya onye Livai, nye kwa ọbìa, nye kwa nwa-nb͕ei, nye kwa nwayi di-ya nwuru, ka ha we rie nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, afọ ewe ju ha; 13 i gāsi kwa n'iru Jehova, bú Chineke-gi, Ekpochapuwom ihe nsọ ahu n'ulom, ọzọ kwa, enyewom ya ndi Livai, nye kwa ọbìa, nye kwa nwa-nb͕ei, nye kwa nwayi di-ya nwuru, dika ihe nile I nyere n'iwu si di nke I nyerem n'iwu: agabigaghm ihe nile I nyere n'iwu, echezọghkwam: 14 erighm ihe sitere na ya n'iru-újúm, ekpochapughkwam ihe sitere na ya n'adighi-ọcha, enyeghkwam ihe sitere na ya bayere onye nwuru anwu: egewom nti olu Jehova, bú Chinekem, emewom dika ihe nile si di nke I nyeworom n'iwu. 15 Si n'ebe-obibi nsọ Gi, si n'elu-igwe, le anya, gọzie ndi-Gi, bú Israel, na ala-ubi ahu nke I nyeworo ayi, dika I ṅuru nna-ayi-hà iyi, bú ala miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya. 16 Ubọchi ta ka Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi iwu ime ukpuru ndia na ikpé ndia: i gēwere kwa obi-gi nile, were kwa nkpuru-obi-gi nile, debe ha, me kwa ha. 17 Jehova ka i meworo ka Ọ si ta na Ọ gāburu gi Chineke, na i gēje kwa ije n'uzọ-Ya nile, debe kwa ukpuru-Ya nile, na ihe nile O nyere n'iwu, na ikpé-Ya nile, ge kwa nti olu-Ya: 18 Jehova emewo kwa ka i si ta na i gāburu Ya ndi nke aka Ya, dika Ọ gwaworo gi okwu, na i gēdebe kwa ihe nile O nyere n'iwu; 19 na Ọ gēme kwa gi ka i kachasia mba nile O meworo elu, ibu otuto, ibu kwa aha, ibu kwa ihe mara nma; ka i we buru-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, ndi nsọ, dika O kwuworo.

Deuteronomi 27

1 Moses na ndi-okenye Israel we nye ndi Israel iwu, si, Debe ihe nile enyere n'iwu, nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta. 2 Ọ gēru kwa n'ubọchi ahu mb͕e unu gāgabiga Jọdan rue ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, na i gēguzoro onwe-gi nkume uku ọtọ, were ihe-ntechi techie ha: 3 i gēdekwasi kwa ha okwu nile nke iwu a, mb͕e i gabigasiri; ka i we ba n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya, dika Jehova, bú Chineke nke nna-gi-hà, gwaworo gi okwu. 4 Ọ gēru kwa, mb͕e unu gabigasiri Jọdan, na unu gēguzo nkume ndia ọtọ, nke mu onwem nēnye unu n'iwu, n'ugwu Ibal, i gēwere kwa ihe-ntechi techie ha. 5 I gēwu-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, bú ebe-ichu-àjà nkume: emela ka ihe-ọlu ígwè ga n'elu ha. 6 I gēji nkume zuru okè wue ebe-ichu-àjà nke Jehova, bú Chineke-gi: i gēsure-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, àjà-nsure-ọku n'elu ya: 7 i gāchu kwa àjà-udo, ri kwa ihe n'ebe ahu; i gāǹuri kwa ọṅu n'iru Jehova, bú Chineke-gi. 8 I gēdekwasi kwa na nkume ndia okwu nile nke iwu a, agātu akika ha nke-ọma. 9 Moses na ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, we gwa Israel nile okwu, si, Nọdu du, ge kwa nti, Israel; ubọchi ta ka i ghọworo Jehova, bú Chinek-gi, otù ndi. 10 I gēge kwa nti olu Jehova, bú Chineke-gi, me ihe nile O nyere n'iwu, na ukpuru-Ya nile, nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta. 11 Moses we nye ndi Israel iwu n'ubọchi ahu, si, 12 Ndia gēguzo n'elu ugwu Geraizim igọzi ndi Israel, mb͕e unu gabigasiri Jọdan; Simeon, na Livai, na Juda, na Isaka, na Josef, na Benjamin: 13 ndia gēguzo kwa n'ugwu Ibal bayere nkọcha; Reuben, na Gad, na Asha, na Zebulun, na Dan, na Naftali. 14 Ndi Livai gēwere olu di elu za, si ndikom nile nke Israel, 15 Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu nke nēme arusi apiri api ma-ọbu arusi awuru awu, bu ihe-árú nke Jehova, ọlu aka nke onye nātu akika, we tiye ya n'ebe nzuzo. Ndi Israel nile gāza kwa, si, Amen. 16 Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nēlelì nna-ya ma-ọbu nne-ya. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen. 17 Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nēwezuga ókè-ala ab͕ata-obi-ya. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen. 18 Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nēme onye-ìsì ka ọ jehie n'uzọ. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen. 19 Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nēwezuga ikpé nke ọbìa, na nke nwa-nb͕ei, na nke nwayi di-ya nwuru. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen. 20 Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye ya na nwunye nna-ya nēdina; n'ihi na o kpughewo uwe kpuchiri ọtọ nna-ya. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen. 21 Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye ya na anumanu ọ bula nēdina. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen. 22 Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye ya na nwa-nne-ya nwayi nēdina, bú nwa-nwayi nke nna-ya, ma-ọbu nwa-nwayi nke nne-ya. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen. 23 Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye ya na nne-nwunye-ya nēdina. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen. 24 Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nētib͕u madu-ibe-ya na nzuzo. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen. 25 Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nānara ihe-iri-ngo itib͕u madu, bú iwusi ọbara nke onye nēmeghi ihe ọjọ. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen. 26 Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nēmeghi ka okwu nile nke iwu a guzosie ike, ime ha. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.

Deuteronomi 28

1 Ọ gēru kwa, ọ buru na i ge nti nke-ọma n'olu nke Jehova, bú Chineke-gi, ilezi anya ime ihe nile O nyere n'iwu, bú nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, na Jehova, bú Chineke-gi, gēme gi ka i kachasia mba nile nke uwa elu: 2 ngọzi ndia nile gābiakwasi kwa gi, we rue gi aru, mb͕e i gēge nti olu Jehova, bú Chineke-gi. 3 Onye agọziri agọzi ka gi onwe-gi gābu n'obodo, onye agọziri agọzi ka gi onwe-gi gābu kwa n'ọhia. 4 Ihe agọziri agọzi ka ọ gābu, bú nkpuru nke afọ-gi, na nkpuru nke ala-ubi-gi, na nkpuru nke anu-ulo-gi, bú umu ehi-gi muru, na umu ìgwè ewu na aturu gi. 5 Ihe agọziri agọzi ka abọ-gi na ihe-gi iji agwọ achicha gābu. 6 Onye agọziri agọzi ka gi onwe-gi gābu na nbata-gi, onye agọziri agọzi ka gi onwe-gi gābu kwa n'ọpupu-gi. 7 Jehova gēme ka etib͕ue n'iru gi ndi-iro-gi ndi nēbili imegide gi: n'otù uzọ ka ha gāpukuru gi, ma n'uzọ asa ka ha gāb͕alaga n'iru gi. 8 Jehova gēnye ngọzi-Ya iwu n'ebe i nọ n'ọba-gi nile, na nime nseti aka-gi nile; Ọ gāgọzi kwa gi n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi. 9 Jehova gēme ka i guzosiere Ya ike ibu ndi nsọ, dika Ọ ṅuru gi iyi; mb͕e i gēdebe ihe nile Jehova, bú Chineke-gi, nyere n'iwu, mb͕e i gēje kwa ije n'uzọ-Ya nile. 10 Ndi nile nke uwa gāhu kwa na ọ bu aha Jehova ka anākpọkwasi gi; ha gātu kwa egwu gi. 11 Jehova gēme kwa ka i babiga uba okè bayere ezi ihe, nime nkpuru nke afọ-gi, na nime nkpuru nke anu-ulo-gi, na nime nkpuru nke ala-ubi-gi, n'elu ala ahu nke Jehova ṅuru nna-gi-hà iyi inye gi. 12 Jehova gēmeghere gi ezi ulo-àkù-Ya, bú elu-igwe, inye miri-ozuzo nke ala-gi na mb͕e-ya, na igọzi omume nile nke aka-gi; i gēbinye kwa ọtutu mba ihe, ma gi onwe-gi agaghi-ebiri ihe. 13 Jehova gēme kwa gi isi, ọ bughi ọdudu; i gādi nání n'elu, i gaghi-adi kwa n'okpuru; mb͕e i gēge nti ihe nile Jehova, bú Chineke-gi, nyere n'iwu, nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, idebe na ime ha; 14 ma ewezugala onwe-gi n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe n'okwu nile ọ bula nke mu onwem nēnye unu n'iwu ta, ijeso chi di iche iche ọzọ ifè ha òfùfè. 15 Ma ọ gēru, ọ buru na i geghi nti olu Jehova, bú Chineke-gi, ilezi anya ime ihe nile O nyere n'iwu na ukpuru-Ya nile nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta; na nkọcha nile ndia gābiakwasi gi, we rue gi aru. 16 Onye anābu ọnu ka i gābu n'obodo, onye anābu ọnu ka i gābu kwa n'ọhia. 17 Ihe anābu ọnu ka abọ-gi na ihe-gi iji gwọ achicha gābu. 18 Ihe anābu ọnu ka ọ gābu, bú nkpuru nke afọ-gi, na nkpuru nke ala-ubi-gi, na umu ehi-gi muru, na umu ìgwè ewu na aturu-gi. 19 Onye anābu ọnu ka i gābu na nbata-gi, onye anābu ọnu ka i gābu kwa n'ọpupu-gi. 20 Jehova gēzikwasi gi ọbubu-ọnu, na ob͕ub͕a-aghara, na ibasi-nba-ike, nime nseti aka-gi nile nke i nēme, rue mb͕e agēkpochapu gi, ru kwa mb͕e i gāla n'iyì ngwa ngwa; n'ihi ihe ọjọ nke omume-gi nile nke i ji rapum. 21 Jehova gēme ka ajọ ọria nke nēfe efe rapara n'aru-gi, rue mb͕e Ọ gēme ka i gwupu n'elu ala ahu, ebe gi onwe-gi nābà inweta ya. 22 Jehova gēwere ọtita-aru, were kwa aru-ọku, were kwa nruru-ọku, were kwa oké okpom-ọku, were kwa mma-agha, were kwa nchakpọ, were kwa ọmuma-ebù, tib͕ue gi; ha gāchu kwa gi rue mb͕e i gāla n'iyì. 23 Elu-igwe-gi nke di n'elu isi-gi gābu kwa ọla, ala nke di n'okpuru gi gābu kwa ígwè. 24 Jehova gēme ka miri-ozuzo nke ala-gi buru uzuzu na ájá: ọ gēsi n'elu-igwe dakwasi gi, rue mb͕e agēkpochapu gi. 25 Jehova gēme ka etib͕ue gi n'iru ndi-iro-gi: n'otù uzọ ka i gāpukuru ha, ma n'uzọ asa ka i gāb͕alaga n'iru ha: i gāghọ-kwa-ra ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari. 26 Ozu-gi gābu-kwa-ra anu-ufe nile nke elu-igwe, bu-kwa-ra anumanu nke uwa, ihe-oriri, onye-nchuli adighi kwa. 27 Jehova gēwere ihe-ofifi Ijipt, were kwa emerod, were kwa àb͕à, were kwa ọkọ, tib͕ue gi, nke anāpughi ime ka aru-gi di nma na ya. 28 Jehova gēwere ara-ọwiwi, were kwa ikpu-ìsì, were kwa ihe ngbu nke obi, tib͕ue gi: 29 i gāsọghari kwa ìsì n'etiti ehihie, dika onye-ìsì nāsọghari n'ọchichiri, i gaghi-eme kwa ka ije-gi ọ bula ga nke-ọma: i gābu kwa nání onye anēmeb͕u na onye anānapu ihe-ya n'ike ubọchi nile, onye-nzọputa adighi kwa. 30 I gēkwe nkwa ilu nwunye, ma ya na nwoke ọzọ gēdina: i gēwu ulo, ma i gaghi-ebi nime ya: i gāku ubi-vine, ma i gaghi-eme ka ọ pua na nsọ anāsọ ya. 31 Agēb͕u ehi-gi n'anya-gi, ma i gaghi-eri nime anu-ya: agānapu gi inyinya-ibu-gi n'iru gi, ma agaghi-eweghachiri gi ya: agēnye ndi-iro-gi ìgwè ewu na aturu-gi, ma i gaghi-enwe onye-nzọputa. 32 Agēnye ndi ọzọ umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom, ma anya-gi ganēle, we dala n'isi n'ichọ ha ogologo ubọchi nile: ma ọ dighi ihe gādiri ike aka-gi. 33 Nkpuru ala-ubi-gi na ndọb͕u-n'ọlu-gi nile ka otù ndi nke i nāmaghi gēri; ma i gābu nání onye anēmeb͕u emeb͕u na onye anāzọpia azọpia ubọchi-gi nile: 34 i we buru onye nāwi ara n'ihi ihe-ọhuhu anya-gi abua, nke i gāhu. 35 Jehova gēwere ihe-otiti ọjọ, nke anāpughi ime ka aru-gi di nma na ya, tie gi n'ikperè-ukwu-gi abua na n'ogwe-ukwu-gi abua, site n'ọbu-ukwu-gi we rue opu-n'isi-gi. 36 Jehova gēme ka gi na eze-gi, nke i gēguzo ka ọ buru eze-gi, jerue otù mba nke i nāmaghi, ma gi onwe-gi ma nna-gi-hà; i gēfè kwa chi di iche iche ọzọ n'ebe ahu, bú osisi na nkume. 37 I gāghọ kwa ihe-iju-anya, na ilu, na ihe-àkùkù, n'etiti ndi ahu nile ebe Jehova gēdu gi je. 38 I gēwere ọtutu nkpuru-ọghigha pua je n'ubi, ma ọ bu nwantī ka i gāchikọta; n'ihi na igurube gērichapu ya. 39 I gāku ubi-vine di iche iche, lu kwa ha, ma ọ dighi manya-vine i gāṅu, i gaghi-aghọ kọta kwa nkpuru-vine; n'ihi na ikpuru gēri ha. 40 I gēnwe osisi olive n'ókè-ala-gi nile, ma ọ dighi manu i gēte; n'ihi na nkpuru olive gi gādakwosi. 41 I gāmu umu-ndikom na umu-ndinyom, ma ha agaghi-abu nke gi; n'ihi na agādọta ha n'agha. 42 Osisi-gi nile na nkpuru ala-ubi-gi ka ndi ọzọ gēnweta. 43 Ọbìa ahu nke nọ n'etiti gi gārigo n'elu kari gi, nārigo, nārigo; ma gi onwe-gi ganārida ala ala. 44 Onye ahu gēbinye gi ihe, ma gi onwe-gi agaghi-ebinye ya: onye ahu gābu isi, ma gi onwe-gi gābu ọdùdù. 45 Ọbubu-ọnu nile ndia gābiakwasi gi, chu kwa gi, we rue gi aru, rue mb͕e agēkpochapu gi; n'ihi na i geghi nti olu Jehova, bú Chineke-gi, idebe ihe nile O nyere n'iwu na ukpuru-Ya nile nke O nyere gi n'iwu: 46 ha gādikwasi kwa gi ibu ihe-iriba-ama na ibu ihe-ebube, dikwasi kwa nkpuru-gi-rue mb͕e ebighi-ebi: 47 n'ihi na i fèghi Jehova, bú Chineke-gi, òfùfè n'ọṅu, na n'obi-utọ, n'ihi iba-uba nke ihe nile: 48 i gēfè kwa ndi-iro-gi, ndi Jehova gēzì megide gi, n'agu, na n'akpiri-ikpọ-nku, na n'ib͕a-ọtọ, na n'ukọ ihe nile: ọ gētiye kwa yoke ígwè n'olu-gi, rue mb͕e ọ gēkpochapu gi. 49 Jehova gēsi n'ebe di anya bulie otù mba imegide gi, site na nsọtu uwa, dika ugo si efe; bú mba nke i nānughi asusu-ya; 50 mba nke nwere iru di egwu, nke nāhughi okenye iru-ọma, nke nēmeghi kwa nwata amara: 51 ọ gēri kwa nkpuru nke anu-ulo-gi, na nkpuru nke ala-ubi-gi, rue mb͕e agēkpochapu gi: ọ gaghi-ekwe kwa ka ọka, na manya-vine ọhu, na manu, na umu ehi-gi muru, na umu ìgwè ewu na aturu-gi, fọduru gi, rue mb͕e ọ gēme ka i la n'iyi. 52 Ọ gānọchigide kwa gi n'agha n'ọnu-uzọ-ama-gi nile, rue mb͕e mb͕idi-gi nile gāda, bú mb͕idi ahu di elu nke ewusi-kwa-ra ike, nke gi onwe-gi nātukwasi obi na ha, n'ala-gi nile: ọ gānọchigide kwa gi n'agha n'ọnu-uzọ-ama-gi nile n'ala-gi nile, nke Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi. 53 I gēri kwa nkpuru nke afọ-gi, bú anu-aru umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom, ndi Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi; nime nnọchigide-n'agha na nime nkpab͕u, nke ndi-iro-gi nākpab͕u gi. 54 Nwoke nke di nro n'etiti gi, nke di kwa pekepeke nke-uku, anya-ya gājọ njọ n'aru nwa-nne-ya, na n'aru nwunye nke obi-ya, na n'aru umu-ya fọduru nke ọ kwere ka ha fọdu: 55 ọ we ghara inye onye ọ bula nime ha ufọdu nime anu-aru umu-ya nri ọ ga-eri, n'ihi na ọ dighi ihe ọ bula fọduru ya; nime nnọchigide-n'agha na nime nkpab͕u, nke onye-iro-gi nākpab͕u gi n'ọnu-uzọ-ama-gi nile. 56 Nwanyi nke di nro n'etiti gi, nke di kwa pekepeke, nke nādighi-anwa iguzo ọbu-ukwu-ya n'ala n'ihi idi-pekepeke na n'ihi idi-nro, anya-ya gājọ njọ n'aru di nke obi-ya, na n'aru nwa-ya nwoke, na n'aru nwa-ya nwayi; 57 na n'aru ichi-ya nke nēsi apata ukwu-ya puta, na n'aru umu-ya nke ọ nāmu; n'ihi na ọ gēri ha na nzuzo n'ukọ ihe nile: nime nnọchigide-n'agha na nime nkpab͕u, nke onye-iro-gi nākpab͕u gi n'ọnu-uzọ-ama-gi nile. 58 Ọ buru na i lezighi anya ime okwu nile nke iwu a nke edeworo n'akwukwọ a, ka i we tua egwu aha nka nke di nsọpuru di kwa egwu, JEHOVA, bú CHINEKE-GI; 59 Jehova gēme kwa ka ihe-otiti-gi nile na ihe-otiti nile nke nkpuru-gi di ebube, ha gābu ihe-otiti uku, nke nānọgide kwa anọgide, na ọria ọjọ, nke nānọgide kwa anọgide. 60 Ọ gēme kwa ka nriaria nile nke Ijipt biaghachi n'aru gi, bu nke i turu ujọ; ha gārapara kwa n'aru gi. 61 Ọria ọ bula kwa, na ihe-otiti ọ bula, nke anēdeghi n'akwukwọ iwu a, ha ka Jehova gēme ka ha rigo n'aru gi, rue mb͕e agēkpochapu gi. 62 Unu gāfọdu kwa ndikom ole-na-ole, n'ebe unu diri ka kpakpando elu-igwe n'uba; n'ihi na i geghi nti olu Jehova, bú Chineke-gi. 63 Ọ gēru kwa, na dika obi tọrọ Jehova utọ n'aru unu ime unu nma, na ime ka unu ba uba; otú a ka obi gātọ Jehova utọ n'aru unu ime ka unu la n'iyì, na ikpochapu unu; ewe ropu unu n'elu ala ahu ebe gi onwe-gi nābà inweta ya. 64 Jehova gēme kwa ka i b͕asa n'etiti ndi nile, site n'otù nsọtu uwa we rue nsọtu uwa nke-ọzọ; i gēfè kwa chi di iche iche ọzọ òfùfè n'ebe ahu, nke i nāmaghi, ma gi onwe-gi ma nna-gi-hà, bú osisi na nkume. 65 Ma i gaghi-enwe atughi-ujọ n'etiti mba ndia, ọbu-ukwu-gi agaghi-enwe kwa izu-ike: ma Jehova gēnye gi n'ebe ahu obi nāma jijiji, na ndala-n'isi nke anya, na ọtita-aru nke nkpuru-obi: 66 ndu-gi ganākwu kwa èfè n'iru gi; i gātu kwa oké egwu abali na ehihie, i gaghi-eji kwa ndu-gi aka: 67 I gāsi n'ututu, Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ọ bu anyasi! i gāsi kwa n'anyasi, Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ọ bu ututu! n'ihi oké egwu nke obi-gi nke i gātu, na n'ihi ihe-ọhuhu anya-gi nke i gāhu. 68 Jehova gēme kwa ka i were ub͕ọ laghachi n'Ijipt, n'uzọ nke m'siri gi, I gaghi-ahu kwa ya ọzọ ma-ọli: unu gēwere kwa onwe-unu renye ndi-iro-unu n'ebe ahu ibu orù-ndikom na ibu ndinyom nēje ozi, ma onye-ọb͕ub͕a agaghi-adi.

Deuteronomi 29

1 Ndia bu okwu ọb͕ub͕a-ndu ahu nke Jehova nyere Moses n'iwu ka ya na umu Israel b͕a n'ala Moab, nāgughi ọb͕ub͕a-ndu ahu nke Ya na ha b͕ara nime Horeb. 2 Moses we kpọ Israel nile òkù, si ha, Unu onwe-unu ahuwo ihe nile nke Jehova mere Fero, me kwa ndi-orù-ya nile, me kwa ala-ya nile, n'anya-unu n'ala Ijipt; 3 ọnwunwa uku nile nke anya-gi huru, ihe-iriba-ama nile, na ihe-ebube uku ahu nile: 4 ma Jehova enyeghi unu obi imara ama, na anya ihu ahu, na nti inu anu, rue ta. 5 Emewokwam ka unu je ije ọgu arọ abua n'ọzara: uwe-unu akapughi nká n'aru unu, akpukpọ-ukwu-gi akapughi nká n'ukwu-gi. 6 Ọ dighi achicha unu riworo, ọ dighi kwa manya-vine ma-ọbu ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya unu ṅuworo: ka unu we mara na mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu. 7 Unu we biarue ebe a, Saihon, bú eze Heshbon, na Og, bú eze Beshan, we puta izute ayi ibu agha, ayi we tib͕ue ha: 8 ayi we were ala-ha, were ya nye ndi Reuben, nye kwa ndi Gad, nye kwa nkera ebo Manase, n'ihe-nketa. 9 Debe-kwa-nu okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu a, me kwa ha, ka unu we nwe uche n'ihe nile nke unu nēme. 10 Unu onwe-unu nēguzo ta, unu nile, n'iru Jehova, bú Chineke-unu; ndi-isi-unu, na ebo nile unu, na ndi-okenye-unu, na ndi-odozi-okwu-unu, bú nwoke ọ bula nke Israel, 11 umu-ntakiri-unu, na ndinyom-unu, na ọbìa-gi nke nọ n'etiti ọmuma-ulo-ikwū-gi nile, site n'onye nāwa nkú-gi rue onye nēsere miri-gi: 12 ka i we gabiga ba n'ọb͕ub͕a-ndu nke Jehova, bú Chineke-gi, na n'iṅu-iyi-Ya, nke gi na Jehova, bú Chineke-gi, nāb͕a ta: 13 ka O we me ka i guzosiere Ya ike ta ibu otù ndi, ka Ya onwe-ya we buru-kwa-ra gi Chineke, dika Ọ gwara gi, na dika Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi, bú Abraham, na Aisak, na Jekob. 14 Ọ bughi kwa nání unu ka mu onwem nāb͕a ọb͕ub͕a-ndu a na iṅu-iyi a nye; 15 kama ọ bu onye nọ n'ebe a n'etiti ayi nēguzo ta n'iru Jehova, bú Chineke-ayi, ọ bu kwa onye nānọghi n'ebe a n'etiti ayi ta: 16 (n'ihi na unu onwe-unu mara otú ayi biri n'ala Ijipt; na otú ayi gabigara n'etiti mba nile nke unu gabigara agabiga; 17 unu ahuwo kwa ihe-árú nile ha, na arusi nile ha, bú osisi na nkume na ọla-ọcha na ọla-edo, nke di n'etiti ha: ) 18 ka nwoke, ma-ọbu nwayi, ma-ọbu ab͕uru, ma-ọbu ebo, we ghara idi n'etiti unu, nke obi-ya nēchigharí pua ta n'ebe Jehova, bú Chineke-ayi, nọ, ije ifè chi nile nke mba ahu nile òfùfè; ka nkpọrọgwu nke nāmi ńsí na wormwood we ghara idi n'etiti unu; 19 o we rue, mb͕e ọ gānu okwu nile nke ọb͕ub͕a-iyi a, na ọ gāgọzi onwe-ya n'obi-ya, si, Udo ka m'gēnwe, ọ bu ezie na n'isi-ike nke obim ka m'nēje ije, ka m'we were iṅubiga-ihe-okè tukwasi n'akpiri-ikpọ-nku: 20 Jehova agaghi-ekwe ib͕aghara ya, kama mb͕e ahu iwe Jehova na ekworo-Ya gākwu anwuru-ọku imegide nwoke ahu, ọb͕ub͕a-iyi nile edeworo n'akwukwọ a gāmakpu kwa n'aru ya, Jehova gēhichapu kwa aha-ya n'okpuru elu-igwe. 21 Jehova gākpaputa kwa ya n'ebo nile nke Israel rue ihe ọjọ, dika ọb͕ub͕a-iyi nile nke ọb͕ub͕a-ndu ahu si di nke edeworo n'akwukwọ iwu a. 22 Ọb͕ọ ahu nke di n'iru, bú umu-unu ndi gēbili inọchi unu, na onye ala ọzọ nke gēsi n'ala di anya bia, gāsi, mb͕e ha nāhu ihe-otiti nile nke ala ahu, na ọria nile ya, nke Jehova jiworo me ka ọ nāria ọria; 23 mb͕e ha nāhu kwa na ala-ya nile bu brimstone, na nnú, na orire-ọku, na adighi-agha ya nkpuru, na ọ dighi-eme kwa ka ihe pue, na ọ dighi kwa ihe-ọkukú ọ bula nētolite nime ya, dika nkwatu Sọdọm na Gọmọra na Adma na Zeboim, nke Jehova kwaturu n'iwe-Ya na n'ọnuma-Ya: 24 ọbuná mba nile ahu gāsi, N'ìhi gini ka Jehova meworo ala nka otú a? gini bu isi idi-ọku iwe uku a? 25 Ha gāsi kwa, Ọ bu n'ihi na ha rapuru ọb͕ub͕a-ndu Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, nke Ya na ha b͕ara mb͕e O mere ka ha si n'ala Ijipt puta; 26 ha we je fè chi ọzọ òfùfè, kpọ kwa isi ala nye ha, bú chi nke ha nāmaghi, nke Ọ nēkèghi n'òkè nye ha: 27 iwe Jehova we di ọku megide ala nka, ime ka nkọcha nile nke edeworo n'akwukwọ a biakwasi ya: 28 Jehova we ropu ha n'ala-ha n'iwe, na'ọnuma, na n'oké iwe, we tubà ha n'ala ọzọ, otú ọ di ta. 29 Ihe nile ezoro ezo diri Jehova, bú Chineke-ayi: ma ihe nile ekpughere ekpughe diri ayi, di-kwa-ra umu-ayi rue mb͕e ebighi-ebi, ka ayi we me okwu nile nke iwu a.

Deuteronomi 30

1 Ọ gēru kwa, mb͕e ihe ndia nile gābiakwasi gi, bú ngọzi ahu na nkọcha ahu nke m'tiyeworo n'iru gi, mb͕e i gēme kwa ka ha biaghachi n'obi-gi n'etiti mba nile, ebe Jehova, bú Chineke-gi, nupuworo gi, 2 mb͕e i gēwere kwa obi-gi nile na nkpuru-obi-gi nile laghachikuru Jehova, bú Chineke-gi, ge kwa nti olu-Ya dika ihe nile si di nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, gi onwe-gi na umu-gi; 3 na Jehova, bú Chineke-gi, gēme ka ndi-gi adọtara n'agha lata, Ọ gēnwe kwa obi-ebere n'aru gi, laghachi, chikọputa gi nime ndi ahu nile, ebe Jehova, bú Chineke-gi, meworo ka i b͕asa. 4 Ọ buru na onye nke gi enupuru enupu anọ na nsọtu elu-igwe, n'ebe ahu ka Jehova, bú Chineke-gi, gāchikọputa gi, n'ebe ahu ka Ọ gēweputa kwa gi. 5 Jehova, bú Chineke-gi, gēme kwa ka i ba n'ala ahu nke nna-gi-hà nwetara, i gēnweta kwa ya; Ọ gēme kwa gi nma, me kwa ka i ba uba kari nna-gi-hà. 6 Jehova, bú Chineke-gi, gēbì kwa n'obi-gi, na obi nkpuru-gi, úgwù, iwere obi-gi nile, na iwere nkpuru-obi-gi nile, hu Jehova, bú Chineke-gi, n'anya, ka i we di ndu. 7 Jehova, bú Chineke-gi, gētiyekwasi ọb͕ub͕a-iyi ndia nile n'isi ndi-iro-gi, na n'isi ndi nākpọ gi asì, ndi churu gi. 8 Gi onwe-gi gālaghachi kwa, ge nti olu Jehova, me ihe nile O nyere n'iwu, nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta. 9 Jehova, bú Chineke-gi, gēme kwa ka i babiga uba okè n'omume nile nke aka-gi, nime nkpuru nke afọ-gi, na nime nkpuru nke anu-ulo-gi, na nime nkpuru nke ala-ubi-gi, bayere ezi ihe: n'ihi na obi gātọ kwa Jehova utọ ọzọ n'aru gi ime gi nma, dika obi tọrọ Ya utọ n'aru nna-gi-hà: 10 mb͕e i gēge nti olu Jehova, bú Chineke-gi, idebe ihe nile O nyere n'iwu na ukpuru-Ya nile nke edeworo n'akwukwọ iwu a; mb͕e i were obi-gi nile, were kwa nkpuru-obi-gi nile, chigharikute Jehova, bú Chineke-gi. 11 N'ihi na ihe a enyere n'iwu nke mu onwem nēnye gi 'niwu ta, ọ bughi ihe kariri gi ime ka ọ bu, ọ bughi kwa ihe diri gi anya ka ọ bu. 12 Ọ dighi n'elu-igwe, ka i we si, Ònye gārigoro ayi n'elu-igwe, wetara ayi ya, me ka ayi nuru ya, ka ayi we me ya? 13 Ọ dighi kwa n'ofè oké osimiri, ka i we si, Ònye gāgabigara ayi n'ofè oké osimiri, wetara ayi ya, me ka ayi nuru ya, ka ayi we me ya? 14 Kama okwu ahu di gi ezi nso, n'ọnu-gi, na n'obi-gi, ka i we me ya. 15 Le, etiyewom n'iru gi ta ndu na ezi ihe, na ọnwu na ihe ọjọ; 16 n'ihi na mu onwem nēnye gi iwu ta ihu Jehova, bú Chineke-gi, n'anya, na ije ije n'uzọ-Ya nile, na idebe ihe nile O nyere n'iwu, na ukpuru-Ya nile, na ikpé-Ya nile, ka i we di ndu, ba kwa uba, ka Jehova, bú Chineke-gi, we gọzi kwa gi n'ala ahu ebe gi onwe-gi nābà inweta ya. 17 Ma ọ buru na obi-gi echigharia, i we ghara inu anu, kama eduhie gi, we kpọ isi ala nye chi ọzọ, we fè ha òfùfè; 18 egosiwom unu ta, na unu aghaghi ila n'iyì; unu agaghi-eme ka ubọchi-unu di anya n'elu ala ahu, ebe gi onwe-gi nāgabiga Jọdan ibà ka i nweta ya. 19 Emewom ka elu-igwe na ala b͕a àmà megide unu ta, na ọ bu ndu na ọnwu, ngọzi ahu na nkọcha ahu, ka m'tiyeworo n'iru gi: gi rọrọ kwa ndu, ka i we di ndu, gi onwe-gi na nkpuru-gi: 20 ihu Jehova, bú Chineke-gi, n'anya, na ige nti olu-Ya, na irapara n'aru Ya: n'ihi na Ya onwe-ya bu ndu-gi, na ogologo nke ubọchi-gi: ka i we biri n'elu ala ahu nke Jehova ṅuru nna-gi-hà iyi, bú Abraham, na Aisak, na Jekob, inye ha.

Deuteronomi 31

1 Moses we je gwa Israel nile okwu ndia. 2 Ọ we si ha, Ọgu arọ isi ka m'b͕ara ta; apughm ipu apu na ibata abata ọzọ: Jehova asiwokwam, I gaghi-agabiga Jọdan nka. 3 Jehova, bú Chineke-gi, Ya onwe-ya nāgabiga n'iru gi, Ya onwe-ya gēkpochapu mba ndia n'iru gi, i gēnweta kwa ha: Joshua, ya onwe-ya nāgabiga n'iru gi, dika Jehova kwuworo. 4 Jehova gēme kwa ha dika O mere Saihon, me kwa Og, bú ndi-eze ndi-Amorait, me kwa ala-ha; ndi O kpochapuru. 5 Jehova gāra kwa ha nye n'iru unu, unu gēme kwa ha dika ihe nile enyere n'iwu si di, nke m'nyeworo unu n'iwu. 6 Dinu ike, nwe-kwa-nu ume, unu atula egwu, unu ama-kwa-la jijiji n'iru ha; n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, Ya onwe-ya bu onye gi na Ya nēje; Ọ gaghi-ara gi aka, Ọ gaghi-arapu kwa gi. 7 Moses we kpọ Joshua òkù, si ya n'anya Israel nile, Di ike, nwe kwa ume: n'ihi na gi onwe-gi gēsoro ndi nka ba n'ala ahu nke Jehova ṅuru ndi bu nna-ha iyi ínye ha; gi onwe-gi gēme kwa ka ha keta ya. 8 Jehova kwa, Ya onwe-ya bu onye nēje n'iru gi; Ọ gānọyere gi, Ọ gaghi-ara gi aka, Ọ gaghi-arapu kwa gi: atula egwu, atu-kwa-la ujọ. 9 Moses we de iwu a n'akwukwọ, were ya nye ndi-nchu-àjà, bú umu Livai, ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, ọ nye kwa ndi-okenye nile nke Israel. 10 Moses we nye ha iwu, si, N'ọgwugwu arọ asa, na mb͕e akara àkà nke arọ nrapu ahu, n'ememe ulo-ntu, 11 mb͕e Israel nile gābia ka ahu ha anya n'iru Jehova, bú Chineke-gi, n'ebe ahu nke Ọ gārọputa, i gāgu iwu a n'iru Israel nile na nti-ha. 12 Kpọkọta ndi Israel, bú ndikom, na ndinyom, na umu-ntakiri, na ọbìa-gi nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, ka ha we nu, ka ha we muta kwa, we tua egwu Jehova, bú Chineke-unu, lezi kwa anya ime okwu nile nke iwu a; 13 umu-ha, ndi nāmaghi, gānu kwa, we muta itu egwu Jehova, bú Chineke-unu, ubọchi nile nke unu onwe-unu nādi ndu n'elu ala ebe unu nāgabiga Jọdan inweta ya. 14 Jehova we si Moses, Le, ubọchi-i gānwu nābiaru nso: kpọ Joshua, guzo-kwa-nu onwe-unu n'ulo-ikwū nzute, ka M'we nye ya iwu. Moses na Joshua we je, guzo onwe-ha n'ulo-ikwū nzute. 15 Ewe hu Jehova anya n'Ulo-ikwū ahu n'ogidi igwe-oji: ogidi igwe-oji ahu we guzo n'elu ọnu-uzọ Ulo-ikwū ahu. 16 Jehova we si Moses, Le, gi na nna-gi-hà ganēdina; ndi nka gēbili kwa, soro chi ala ọzọ nile nke ala ahu kwa iko, bú ebe ha onwe-ha nābà n'etiti ya, ha gārapukwam, mebi kwa ọb͕ub͕a-ndum nke Mu nà ha b͕ara. 17 Iwem gādi kwa ọku megide ha n'ubọchi ahu, M'gārapu kwa ha, zopu irum n'aru ha, ha gābu kwa ihe agēri eri, ọtutu ihe ọjọ na ahuhu gāchọta kwa ha; ha gāsi kwa n'ubọchi ahu, Ọ̀ bughi n'ihi na Chineke-ayi anọghi n'etiti ayi ka ihe ọjọ ndia chọtaworo ayi? 18 Mu onwem aghaghi kwa izo irum n'ubọchi ahu n'ihi ihe ọjọ nile nke ha meworo, n'ihi na ha echewo chi di iche iche ọzọ iru. 19 Ma ub͕u a, Derenu onwe-unu abù a, gi zí kwa ya umu Israel: tiye ya n'ọnu-ha, ka abù a we burum ihe-àmà megide umu Israel. 20 N'ihi na mb͕e M'gēmewori ka ha ba n'ala ahu nke M'ṅuru ndi bu nna-ha iyi, bú ala miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya; mb͕e ha gēriwo-kwa-ri ihe, afọ eju kwa ha, ha we ma abuba; ha gēche kwa chi ọzọ iru, fè ha òfùfè, we leliam anya, mebi kwa ọb͕ub͕a-ndum. 21 O gēru kwa, mb͕e ọtutu ihe ọjọ na ahuhu gāchọta ha, na abù a gāb͕a àmà n'iru ha dika ihe-àmà; n'ihi na agaghi-echezọ ya pua n'ọnu nkpuru-ha: n'ihi na amawom ncheputa-ha nke ndi ahu nēme ta, tutu Mu eme ka ha ba n'ala ahu nke M'ṅuru iyi inye ha. 22 Moses we de abù a n'akwukwọ n'ubọchi ahu, zí kwa ya umu Israel. 23 O we nye Joshua nwa Nun iwu, si, Di ike, nwe kwa ume: n'ihi na gi onwe-gi gēme ka umu Israel ba n'ala ahu nke M'ṅuru ha iyi inye ha: Mu onwem gānọye-kwa-ra gi. 24 O rue, mb͕e Moses debisiri okwu nile nke iwu a n'akwukwọ, rue mb͕e edezuru ha, 25 na Moses nyere ndi Livai, ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, iwu, si, 26 Were akwukwọ iwu a, tiye ya n'akuku ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, bú Chineke-unu, ka o we di n'ebe ahu ibu ihe-àmà megide gi. 27 N'ihi na mu onwem amawo nnupu-isi-gi, na nkwesi-olu-ike-gi: le, mb͕e m'nānọ ndu n'etiti unu ta, unu aburuwo ndi nānupu isi n'okpuru Jehova; ùnu gēsi aṅa ghara inupu isi kari nke-uku mb͕e ọnwum gasiri? 28 Kpọkọtaranum ndi-okenye nile nke ebo nile unu, na ndi-odozi-okwu-unu, ka m'kwu kwa okwu ndia na nti-ha, me ka elu-igwe na ala b͕a àmà megide ha. 29 N'ihi na amawom na mb͕e ọnwum gasiri unu gēbibi onwe-unu nke-uku, wezuga onwe-unu n'uzọ ahu nke m'nyeworo unu n'iwu; ihe ọjọ gādakwasi kwa unu na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia; n'ihi na unu gēme ihe ọjọ n'anya Jehova, ikpasu Ya iwe n'omume aka-unu. 30 Moses we kwue na nti nkpọkọta nile nke Israel okwu nile nke abù a, rue mb͕e ekwuzuru ha.

Deuteronomi 32

1 Ṅanu nti, unu elu-igwe, ka m'kwu kwa ihe; Ka uwa nu kwa okwu ọnum: 2 Nmutam gātasi dika miri-ozuzo, Okwu-ọnum ganēruputa dika igirigi; Dika nshansha-miri n'elu ahihia ndu, Di kwa ka oké miri-ozuzo n'elu ihe-ọkukú: 3 N'ihi na aha Jehova ka m'gākpọsa: Nyenu Chineke-ayi idi-uku. 4 Oké nkume ahu, ihe zuru okè ka ọlu-Ya bu: N'ihi na uzọ-Ya nile bu ikpé ziri ezi: Chineke Nke kwesiri ntukwasi-obi, Nke nēnweghi ajọ omume, Onye ezi omume na onye ziri ezi ka Ọ bu. 5 Ha ebibiwo onwe-ha, ọ bughi nke umu-Ya ka ọlu nke di ha n'aru bu. Ha bu ọb͕ọ b͕agọrọ ab͕agọ nke rọ-kwa-ra arọ. 6 Ùnu nēnyeghachi Jehova otú a, Unu ndi-nzuzu ndi nāmaghi ihe? Ọ̀ bughi ya onwe-ya bu nna-gi onye nwetaworo gi? Ya onwe-ya emewo gi, me kwa ka i guzosie ike. 7 Cheta ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga, Ghọta arọ nke ọtutu ọb͕ọ: Jua nna-gi, ọ gēgosi kwa gi; Jua ndi-okenye-gi, ha gāgwa kwa gi. 8 Mb͕e Onye kachasi ihe nile elu mere ka mba nile keta ihe-ha, Mb͕e O kesara umu madu, O guzoro ókè nile nke ndi nileDika ọnu-ọgugu umu Israel si di. 9 N'ihi na òkè Jehova bu ndi-Ya; Jekob bu akuku ihe-nketa-Ya. 10 Ọ chọtara ya n'ala ọzara, Na n'ihe tọb͕ọrọ nkití, bú ala tọb͕ọrọ n'efu nke nāb͕ọ uja. Ọ nāb͕a ya buruburu, Ọ nēme ka ọ ghọta ihe, Ọ nēchezi ya dika nwantanta anya-Ya: 11 Dika ugo nākpọte umu di n'akwu-ya, Nērughari n'elu umu-ya, Nāb͕asa nkù-ya, nāghọrọ ha, Nēbu ha n'elu nkù-ya: 12 Otú a Jehova, nání Ya, nēdu ya, Ọ dighi kwa chi ala ọzọ diyere ya. 13 Ọ nēme ka ebe di elu nke uwa būru ya dika inyinya, Ọ we rie ihe-ọmume nke ubi; O me-kwa-ra ya ka ọ mia manu-aṅu site na nkume di elu, Na manu site n'oké nkume ọ́mú; 14 Miri-ara nke raru araru nke ìgwè ehi, na miri-ara nke ìgwè ewu na aturu, Ya na abuba umu-aturu, Na ebulu àb͕ọ̀ Beshan, na ewu, Tiyere abuba obi ọka wheat; Ọbara nkpuru-vine ka i nāṅu kwa, bú manya-vine. 15 Jeshurun we ma abuba, we b͕a ukwu: I mawo abuba, i buwo ibù, abuba ekpuchiwo aru-gi: O we rapu Chineke nke mere ya, We kpọ Oké Nkume nke nzọputa-ya onye-nzuzu. 16 Ha nēwere ndi ala ọzọ me ka O kwo ekworo, Ha nēwere ihe-árú di iche iche kpasue Ya iwe. 17 Ha nāchuru ndi-mọ ọjọ aja, ndi nābughi Chineke, Bú chi ha nāmaghi, Ndi ọhu ndi si n'ebe di nso bata, Ndi nna-unu-hà nātughi ujọ. 18 Oké Nkume ahu nke muru gi ka i nēchefu, I chezọwo kwa Chineke nke muputara gi. 19 Jehova we hu ya, we lelia ha anya, N'ihi nkpasu-iwe nke umu-Ya ndikom na umu-Ya ndinyom. 20 O we si, Ka M'zopu irum n'ebe ha nọ, M'gāhu ihe gābu ikpe-azu-ha: N'ihi na ọb͕ọ nke nāb͕akuta azu ka ha bu, Umu ndi nēkwesighi okwukwe. 21 Ha onwe-ha ewerewo ihe nābughi Chineke mem ka M'kwo ekworo; Ha ewerewo ihe-efu nile ha kpasuem iwe: Mu onwem gēwere kwa ndi nābughi ndi me ha ka kwo ekworo; Mba nzuzu ka M'gēwere kpasue ha iwe. 22 N'ihi na amuyewo ọku n'iwem, Ọ nēre kwa rue ala-mọ nke dichasi ala, Ọ nēripia kwa uwa na ihe-ọmume-ya, Nēme kwa ka ntọ-ala nile nke ugwu nile nwuru ọku. 23 M'gēkpokwasi kwa ha ihe ọjọ; M'gāb͕apusi àkúm nile n'aru ha: 24 Ha gābu ndi tara aru n'agu, na ndi nruru-ọku rub͕uworo, Ya na nbipu di ilu; Ezé anumanu ka M'gēzikwasi kwa ha, Ya na edide nke ihe nākpu akpu nke ájá. 25 Mma-agha gāb͕aba madu aka nwa n'èzí, Oké ujọ gāb͕aba kwa n'ime-ulo nile; Ọ gēkpochapu ma okorọbia ma nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, Nwa nāṅu ara tinyere onye-isi-awọ. 26 Asiwom, M'gāfupu ha, Me ka ncheta-ha kwusi n'etiti madu: 27 Ma ọ buru na atughm ujọ nkpasu-iwe onye-iro, Ka ndi nākpab͕u ha we ghara ichehie, Ka ha we ghara isi, Aka-ayi di elu, Ọ bughi Jehova meworo ihe a nile. 28 N'ihi na mba nke furu efu n'ebe idu-ọdu di ka ha bu, Nghọta adighi kwa nime ha. 29 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ha mara ihe, nwe kwa uche na nka, Ma asi na ha gāghọta ikpe-azu-ha! 30 Òtù onye gēsi aṅa chu nnù madu abua na ọgu iri, Màdu abua gēsi kwa aṅa me ka orú nnù madu na nnù madu ise b͕alaga, Ma ọ buru na Oké Nkume-ha ereghi ha, Ọ buru kwa na Jehova emechibidoghi ha uzọ? 31 N'ihi na oké nkume-ha adighi ka Oké Nkume-ayi, Ndi-iro-ayi bu kwa ndi-ikpe. 32 N'ihi na ọ bu n'osisi vine nke Sọdọm ka osisi vine ha sitere, Site kwa n'ubi Gọmọra: Nkpuru-vine-ha bu nkpuru-vine ńsí, Uyọkọ di ilu ka ha nwere: 33 Edide agwọ di ogologo ka manya-vine-ha bu, Na ńsí di irè nke aju-ala. 34 Ǹka abughi ihe akwakọbaworo n'ebe m'nọ, Ihe akaworo akàrà n'ulo-àkùm? 35 Mu nwe ọ́bọ̀ na nkwughachi, Na mb͕e ukwu-ha gāb͕uchapu: N'ihi na ubọchi nhuju-anya-ha di nso, Ihe nke ejikereworo ha nābia kwa ngwa ngwa. 36 N'ihi na Jehova gēkpeputa ndi-Ya, Cheghari kwa ncheghari bayere ndi-orù-Ya; Mb͕e Ọ nāhu na ihe-iye-aka-ha alawo, Ọ dighi kwa onye eb͕ochiri eb͕ochi ma-ọbu onye arapuru arapu fọduru. 37 Ọ gāsi kwa, Òle ebe chi nile ha nọ? Bú oké nkume nke ha b͕abàra nime ya; 38 Nke nēri abuba àjà nile ha, Nāṅu kwa manya-vine nke àjà-ihe-ọṅuṅu-ha; Ka ha bilie, yere unu aka, Ka ọ buru ebe-nzuzo n'elu unu. 39 Ub͕u a, hunu na Mu onwem, Mu onwem bu Ya, Ọ dighi kwa chi ọzọ Mu na ya nọ: Mu onwem nēme ka anwua, M'nēme kwa ka adi ndu; M'tib͕uwo etib͕u, Mu onwem gēme kwa ka aru di ike: Ọ dighi kwa onye nānaputa n'akam. 40 N'ihi na anameweli akam elu nye elu-igwe, We si, Mu onwem nādi ndu rue mb͕e ebighi-ebi, 41 Ọ buru na amuam mma-agham nēb͕upu àmùmà, O buru kwa na akam ejide ikpé; M'gābọghachi ọ́bọ̀ n'aru ndi nēmegidem, M'gākwughachi kwa ndi nākpọm asi. 42 M'gēme ka àkúm nile ṅubiga ọbara okè, Mma-agham gēri kwa anu-aru; Site n'ọbara ndi eb͕uru eb͕u na ndi adọtara n'agha, Site n'isi ndundu onye-iro. 43 Unu mba ọzọ, soronu ndi-Ya ti nkpu ọṅu: N'ihi na Ọ gābọ̀ ọ́bọ̀ ọbara ndi-orù-Ya, Ọ́bọ̀ ka Ọ gābọghachi kwa n'aru ndi nēmegide Ya, O gēkpuchi kwa nmehie ala-Ya na ndi-Ya. 44 Moses we bia, kwue okwu nile nke abù a na nti ndi Israel, ya onwe-ya, na Hoshea nwa Nun. 45 Moses we gwabìe Israel nile okwu nile ndia: 46 o we si ha, Tukwasi obi-unu n'okwu nile nke mu onwem nāb͕ara unu àmà ta; nke unu gēnye umu-unu n'iwu, ka ha lezie anya ime okwu nile nke iwu a. 47 N'ihi na ọ bughi ihe efu ka ọ bu n'ebe unu nọ; n'ihi na nka bu ndu-unu, ọ bu kwa ihe a ka unu gēwere me ka ubọchi-unu di anya n'elu ala, ebe unu onwe-unu nāgabiga Jọdan inweta ya. 48 Jehova we gwa Moses okwu n'otù ubọchi ahu, si, 49 Rigo n'ugwu a nke Abarim, bú ugwu Nebo, nke di n'ala Moab, nke di n'irú Jeriko; le kwa ala Kenean anya, bú nke Mu onwem nēnye umu Israel n'ihe-onwunwe: 50 gi nwu kwa n'ugwu ahu ebe i nārigo, ka achikọta kwa gi na umu-nna-gi n'ala-mọ; dika Eron, bú nwa-nne-gi, nwuru n'ugwu Hoa, ewe chikọta ya na umu-nna-ya n'ala-mọ: 51 n'ihi na unu mekpuru ihe-nmekpu megidem n'etiti umu Israel na miri Meriba Kedesh, n'ọzara Zin; n'ihi na unu edoghm nsọ n'etiti umu Israel. 52 N'ihi na ọ bu na ncherita-iru ka i gāhu ala ahu; ma i gaghi-abà n'ebe ahu n'ala ahu nke Mu onwem nēnye umu Israel.

Deuteronomi 33

1 Nka bu kwa ngọzi ahu, nke Moses, bú onye nke Chineke, gọziri umu Israel tutu ọnwu-ya. 2 Ọ we si, Jehova siri na Sainai bia, Si kwa na Sia walitere ha; O siri n'ugwu Peran nwuputa, O si-kwa-ra na ndi nsọ anāpughi iguta ọnu bia: Ọku di n'aka-nri-Ya, bú iwu enyere ha. 3 E, Ọ nāhu ndi nke Ya nile n'anya; Ndi nsọ Ya nile di n'aka-gi: Ndi ahu we nọdu ala n'ukwu-gi; Onye ọ bula gānata ufọdu nime okwu-gi. 4 Iwu ka Moses nyere ayi, Bú ihe-nnweta nke nkpọkọta Jekob. 5 Ọ we buru eze nime Jeshurun, Mb͕e ndi-isi ndi Israel chikọtara onwe ha, Ebo nile nke Israel n'otù. 6 Ka Reuben di ndu, ghara kwa inwu; Ma ka ndikom-ya di ole-na-ole. 7 Nka bu kwa ngọzi nke Juda: ọ we si, Jehova, nu olu Juda, Me kwa ka ọ bakute ndi-ya: Aka-ya abua aluworo ya onwe-ya ọ̀gù; Onye-iye-aka megide ndi nākpab͕u ya ka I gābu. 8 Ọ we kwue ihe bayere Livai, si, Izu-okè-Gi na Ìhè-Gi diri onye-ebere-Gi, Onye I nwara na Masa, Onye Gi na ya nēse okwu n'akuku miri Meriba; 9 Onye ahu nke nēkwu okwu bayere nna-ya, baye-kwa-ra nne-ya, si, Ahughm ya; Umu-nne-ya ka ọ nāmataghi kwa; Umu-ya ka ọ nāmaghi kwa; N'ihi na ha edebewo okwu-ọnu-Gi, Ọb͕ub͕a-ndu-Gi ka ha nēchezi kwa. 10 Ha gēzí Jekob ikpé-Gi nile, Iwu-Gi ka ha gēzí kwa Israel: Ha gētiye ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'imi-Gi, Tiye kwa àjà-nsuresi-ọku n'elu ebe-ichu-àjà-Gi. 11 Jehova, gọzie àkù-ya, Ka ọlu aka-ya abua tọ kwa Gi utọ: Mapue úkwù ndi nēbili imegide ya, Na nke ndi nākpọ ya asì, ka ha ghara ibili ọzọ. 12 O kwuru ihe bayere Benjamin, si, Onye Jehova huru n'anya gēbi na ntukwasi-obi n'akuku Ya; O nēkpuchi ya ogologo ubọchi nile, Ọ bu kwa n'etiti ubu-Ya abua ka o nēbi. 13 Ọ we kwue ihe bayere Josef, si, Ihe Jehova nāgọzi ka ala-ya bu; Site n'ihe di oké ọnu-ahia nke elu-igwe, site n'igirigi, Site kwa n'ob͕u-miri nke nāmakpu n'okpuru. 14 Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke ihe-ọmume anyanwu, Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke ihe-npuputa nke ọnwa nile. 15 Site kwa n'isi ihe nke ugwu nke di site na mb͕e ochie, Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke ugwu ntà di mb͕e ebighi-ebi. 16 Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke uwa na ùjú-ya, Na obi-ọma nke Onye bi n'osisi ntà: Ka ngọzi ahu biakwasi n'isi Josef, Na n'opu-n'isi nke onye ekewapuru n'etiti umu-nne-ya. 17 Nwa ehi-ya buru uzọ mu, ima-nma diri ya; Mpi nke atu ka mpi-ya abua bu kwa: Ọ gēwere ha sọkọta ndi nile, rue nsọtu nile nke uwa: Ndi ahu bu kwa usu nile nke orú nnù ndikom na nnù ise nke Efraim, Ndi ahu bu kwa usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Manase. 18 Ọ we kwue ihe bayere Zebulun, si, Zebulun, ṅuria ọṅu n'ọpupu-gi; Isaka, ṅuri kwa ọṅu n'ulo-ikwū-gi nile. 19 Ha gākpọ ndi nile bia n'ugwu; N'ebe ahu ka ha gāchu àjà ezi omume: N'ihi na njuputa nke oké osimiri nile ka ha gāmí dika ara, Ya na ihe nile zoro ezo nke ezoro n'ájá. 20 Ọ we kwue ihe bayere Gad, si, Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Onye nēme ka Gad sa mbara: Dika nne-ọdum ka ọ nēbi, Ọ nādọka kwa ogwe-aka, ya na opu-n'isi. 21 Ọ nāhuta-kwa-ra onwe-ya ihe mbu, N'ihi na ebe ahu ka ekpuchiri òkè onye nēnye iwu; Ọ we soro ndi-isi ndi Israel bia, Ezi omume nke Jehova ka o mere, Na ikpé-Ya nile n'ebe Israel nọ. 22 O we kwue ihe bayere Dan, si, Dan bu nwa ọdum, Ọ nēsi na Beshan maputa. 23 O we kwue ihe bayere Naftali, si, Naftali, onye ewere ihe-utọ me ka afọ ju gi, Onye juputa-kwa-ra na ngọzi Jehova: Gi nweta Ọdida-anyanwu na Ndida. 24 O we kwue ihe bayere Asha, si, Onye agọziri agọzi n'umu ka Asha bu; Ka ihe-ya tọ umu-nne-ya utọ, Ka ọ zọye kwa ukwu-ya na manu. 25 Ígwè na ọla ka akpukpọ-ukwu-gi gābu; Dika ubọchi-gi nile si di kwa, otú a ka ume-gi gādi. 26 Ọ dighi onye di ka Chineke, gi Jeshurun, Onye elu-igwe nēbu dika inyinya n'iyere gi aka, Onye mbara-ígwé nēbu kwa nime nbili-elu-Ya. 27 Ebe-obibi-gi ka Chineke nke di site na mb͕e ochie bu, N'okpuru ka ogwe-aka mb͕e ebighi-ebi di kwa: Ọ chupu-kwa-ra onye-iro n'iru gi, We si, Kpochapu. 28 Israel we biri na ntukwasi-obi, Isi-iyi Jekob nání ya iche, N'ala ọka na manya-vine ọhu; Ọzọ, elu-igwe-ya nātasi igirigi. 29 Onye ihe nile nāgara nke-ọma ka i bu, Israel: Ònye di ka gi? bú ndi Jehova zọputaworo, Onye bu ọta nke iye-aka-gi, Onye bu kwa mma-agha nke nbili-elu-gi! Ndi-iro-gi gērube kwa isi aghughọ n'okpuru gi; Gi onwe-gi gāzọkwasi kwa ebe di elu nke ha ukwu.

Deuteronomi 34

1 Moses we si n'ala ihe nādighi nke Moab rigorue ugwu Nebo, rue elu Pisga, nke di n'iru Jeriko. Jehova we me ka ọ hu ala ahu nile; Gilead, rue Dan; 2 na Naftali nile, na ala nke Efraim na Manase, na ala nile nke Juda, rue oké osimiri nke di n'azu; 3 na Negeb, na Buruburu-ala nke ndagwurugwu Jeriko, bú obodo nkwu, rue Zoa. 4 Jehova we si ya, Nka bu ala ahu nke M'ṅuru Abraham iyi, ṅu-kwa-ra Aisak, ṅu-kwa-ra Jekob, si, Ọ bu nkpuru-gi ka M'gēnye ya: emewom ka i were anya-gi abua hu ya, ma i gaghi-agabiga n'ebe ahu. 5 Moses, bú orù Jehova, we nwua n'ebe ahu n'ala Moab, n'okwu-ọnu Jehova. 6 O we lìe ya na ndagwurugwu ahu n'ala Moab na ncherita-iru Bet-peoa: ma ọ dighi onye mara ílì-ya rue ta. 7 Moses b͕ara ọgu arọ isi mb͕e ọ nwuru: anya-ya adighi-ahu inyoghi-inyoghi, ume-ya apughi n'aru-ya. 8 Umu Israel we kwara Moses ákwá n'ala ihe nādighi nke Moab orú ubọchi na iri: ubọchi nile nke ikwa-ákwá, bú oruru-újú Moses, we zue. 9 Joshua nwa Nun we juputa na mọ nke amam-ihe; n'ihi na Moses ebikwasiwo ya aka-ya abua: umu Israel we ge ya nti, me kwa dika Jehova nyere Moses iwu. 10 Ọ dighi kwa onye-amuma biliri ọzọ n'Israel dika Moses, onye Jehova mara iru na iru; 11 bayere ihe-iriba-ama nile na ihe-ebube nile, nke Jehova zigara ya ime n'ala Ijipt, ime Fero, na ime ndi-orù-ya nile, na ime ala-ya nile; 12 baye-kwa-ra aka ahu di ike nile, baye-kwa-ra ihe egwu uku ahu nile, nke Moses mere n'anya Israel nile.

Joshua 1

1 O rue, mb͕e ọnwu Moses, bú orù Jehova, gasiri, na Jehova gwara Joshua nwa Nun, bú onye nējere Moses ozi, okwu, si, 2 Moses, bú orùm anwuruwo; ma ub͕u a bilie, gabiga Jọdan nka, gi onwe-gi, na ndi nke a nile, rue ala ahu nke Mu onwem nēnye ha, bú umu Israel. 3 Ebe ọ bula nke ọbu-ukwu-unu gāzọkwasi, unu ka M'nyeworo ya, dika M'gwara Moses okwu. 4 Site n'ọzara, na Lebanon nka, we rue osimiri uku ahu, bú osimiri Yufretis, ala nile nke ndi Het, we rue oké osimiri chere iru n'ọdida-anyanwu, ka ókè-ala unu gādi. 5 Ọ dighi nwoke ọ bula gēguzo onwe-ya n'iru gi ubọchi nile nke ndu-gi: dika M'nọyere Moses, otú a ka M'gānọyere gi: M'gaghi-ara gi aka, M'gaghi-arapu kwa gi. 6 Idi ike, nwe kwa ume: n'ihi na gi onwe-gi gēme ka ndi nka keta ala ahu nke M'ṅuru nna-ha iyi inye ha. 7 Nání, di ike, nwe kwa ume nke-uku, ilezi anya ime dika iwu ahu nile si di, nke Moses, bú orùm, nyere gi n'iwu: ewezugala onwe-gi na ya n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe, ka i we nwe uche n'ebe ọ bula i nēje. 8 Akwukwọ iwu a agaghi-apu n'ọnu-gi, kama i gātughari uche nime ya ehihie na abali, ka i we lezie anya ime dika ihe nile si di nke edeworo nime ya: n'ihi na mb͕e ahu i gēme ka ije-gi ga nke-ọma, mb͕e ahu i gēnwe kwa uche. 9 Ènyeghm i iwu? Di ike, nwe kwa ume; amala jijiji, atu-kwa-la ujọ: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi n'ebe ọ bula i nēje. 10 Joshua we nye ndi-ọchi-agha ndi Israel iwu, si, 11 Gabiganu n'etiti ọmuma-ulo-ikwū, nye ndi Israel iwu, si, Doziere onwe-unu ihe unu gēri n'uzọ; n'ihi na ọ fọduru ubọchi atọ unu ewe gabiga Jọdan nka, ibà nime inweta ala ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, nēnye unu inweta ya. 12 Joshua gwa-kwa-ra ndi Reuben, na ndi Gad, na nkera ebo Manase, okwu, si, 13 Chetanu okwu ahu nke Moses, bú orù Jehova, nyere unu n'iwu, si, Jehova, bú Chineke-unu, nēme ka unu zuru ike, Ọ gēnye kwa unu ala nka. 14 Ndinyom-unu na umu-ntakiri-unu na anu-ulo-unu gānọdu n'ala ahu nke Moses nyere unu n'ofè Jọdan; ma unu onwe-unu gāgabiga n'iru umu-nne-unu, chiri ihe-ekike-agha, ndi-dike nile, bú dìnkpà, unu gēye-kwa-ra ha aka; 15 rue mb͕e Jehova gēme ka umu-nne-unu zuru ike, dika O meworo unu, ha we nweta, ọbuná ha onwe-ha, ala ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, nēnye ha: unu we laghachi n'ala nke ihe-nnweta-unu, we nweta ya, bú nke Moses, bú orù Jehova, nyere unu n'ofè Jọdan n'uzọ ọwuwa-anyanwu. 16 Ha we za Joshua, si, Ihe nile nke I nyeworo ayi n'iwu, ayi gēme ya, ebe ọ bula i gēziga ayi, ayi gēje ya. 17 Dika ihe nile si di nke ayi gere Moses nti nime ya, otú a ka ayi gēge gi nti: nání, Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi, dika Ọ nọyere Moses. 18 Onye ọ bula nke gānupu isi n'okwu-ọnu-gi, nke nānughi kwa okwu-gi nile n'ihe nile nke i nēnye ya n'iwu, agēme ka ọ nwua: nání, di ike, nwe kwa ume.

Joshua 2

1 Joshua nwa Nun we si na Shitim zipu ndikom abua na nzuzo, bú ndi-nledo, si, Jenu, le ala ahu, na Jeriko. Ha we je, ba n'ulo otù nwayi nākwa iko, aha-ya bu Rehab, ha we dina n'ebe ahu. 2 Ewe gwa eze Jeriko okwu, si, Le, ndikom batara n'ebe a n'abali a sitere n'umu Israel ileputa ala-ayi. 3 Eze Jeriko we zigara Rehab ozi, si, Me ka ha puta, bú ndikom ahu ndi bakutere gi, ndi bara n'ulo-gi: n'ihi na ọ bu ileputa ala nka nile ka ha biaworo. 4 Nwanyi ahu we kuru ndikom abua ahu, zobe ha; o we si, Ọ bu otú a, ndikom ahu bakuterem, ma amaghm ebe ha si bia: 5 o rue, mb͕e agaje imechi ọnu-uzọ-ama, n'ọchichiri, na ndikom ahu puru: amaghi ebe ndikom ahu jere: chuanu ha ngwa ngwa; n'ihi na unu gēru ha aru. 6 Ma ya onwe-ya mere ka ha rigo n'elu-ulo, o we zobe ha n'ókpòrò flax, nke edoro n'uso nye ya n'elu-ulo. 7 Ndikom ahu we nāchu ha n'uzọ Jọdan rue ngabiga-miri: ha we mechie ọnu-uzọ-ama mb͕e ndi nāchu ha n'azu pusiri. 8 Ma tutu ha onwe-ha edina ala, nwayi ahu we rigokuru ha n'elu-ulo; 9 ọ si ndikom ahu, Amawom na Jehova enyewo unu ala nka, amawokwam na oké ujọ-unu adakwasiwo ayi, amawokwam na ndi nile nēbi n'ala nka ab͕azewo n'iru unu. 10 N'ihi na ayi anuwo otú Jehova mere ka miri Oké Osimiri Uhie takọrọ n'iru unu, mb͕e unu siri n'Ijipt puta; na ihe unu mere eze abua nke ndi-Amorait, ndi bi n'ofè Jọdan, bú Saihon na Og, ndi unu wezugara ka ebibie ha. 11 Ma mb͕e ayi nuru ya, obi-ayi we lọ ayi miri, ọ dighi kwa mọ guzoro ọzọ nime nwoke ọ bula, n'ihi unu: n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, Ya onwe-ya bu Chineke n'elu-igwe di n'elu, na n'elu uwa di n'okpuru. 12 Ma ub͕u a, biko, werenu Jehova ṅuaram iyi, n'ihi na emerem unu ebere, na unu, ọbuná unu onwe-unu, gēmere ulo nnam ebere, nyekwam ihe-iriba-ama ezi-okwu: 13 na unu gēme kwa ka nnam, na nnem, na umu-nnem ndinyom, na ihe nile ha nwere, di ndu, na unu gānaputa kwa ndu-ayi n'ọnwu. 14 Ndikom ahu we si ya, Ndu-ayi lara ndu-unu ka ayi we nwua, ma ọ buru na unu egosighi okwu-ayi nka; ọ gēru kwa, mb͕e Jehova gēnye ayi ala nka, na ayi gēmere gi ebere na ezi-okwu. 15 Ọ we were udọ̀ weda ha site na window: n'ihi na ulo-ya di na nb͕idi obodo, ọ bu kwa n'elu mb͕idi ka o biri. 16 O we si ha, Jenu n'ugwu, ka ndi nāchu unu we ghara izute unu; zo-kwa-nu onwe-unu n'ebe ahu ubọchi atọ, rue mb͕e ndi nāchu unu gālaghachi: emesi kwa unu gēje ije-unu. 17 Ndikom ahu we si ya, Ayi onwe-ayi gābu ndi ikpe nāmaghi n'iyi-gi a nke i meworo ka ayi ṅua. 18 Le, mb͕e ayi onwe-ayi gaje ibata n'ala nka, i gēkegide eriri ogho uhie a nime window nke i ji weda ayi: nna-gi, na nne-gi, na umu-nne-gi, na ulo nna-gi nile, ka i gāchikọta-kwa-ra onwe-gi n'ulo a. 19 Ọ gēru kwa, na onye ọ bula nke gēsi n'ọnu-uzọ ulo-gi pua n'èzi, ọbara-ya gādikwasi n'isi-ya, ayi onwe-ayi gābu kwa ndi ikpe nāmagh: ma onye ọ bula gi na ya gānọ n'ulo, ọbara-ya gādikwasi n'isi-ayi, ma ọ buru na aka ọ bula adikwasi ya. 20 Ma ọ buru na i gosi okwu-ayi nka, ayi gābu kwa ndi ikpe nāmaghi n'iyi-gi nke i meworo ka ayi ṅua. 21 O we si, Dika okwu nile unu si di, otú a ka ọ gādi. O we zilaga ha, ha we je: o we kegide eriri uhie ahu nime window. 22 Ha we je, biarue ugwu ahu, nọdu n'ebe ahu ubọchi atọ, rue mb͕e ndi nāchu ha laghachiri: ndi nāchu ha we chọ ha n'uzọ ahu nile, ma ha achọtaghi ha. 23 Ndikom abua ahu we laghachi, si n'ugwu ahu rida, we gabiga, biakute Joshua nwa Nun; ha we kọrọ ya ihe nile nke dakwasiri ha. 24 Ha we si Joshua, N'ezie Jehova enyewo ala ahu nile n'aka-ayi; ọzọ kwa, ndi nile ndi bi n'ala ahu nāb͕azepu n'iru ayi.

Joshua 3

1 Joshua we bilie n'isi-ututu, ha we si na Shitim bilie ije, we biarue Jọdan, ya onwe-ya na umu Israel nile; ha we nọ ọnọdu-abali n'ebe ahu tutu ha agabiga. 2 O rue, n'ọgwugwu ubọchi atọ, na ndi-ọchi-agha gabigara n'etiti ọmuma-ulo-ikwū; 3 ha we nye ndi Israel iwu, si, Mb͕e unu nāhu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, bú Chineke-unu, na ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, ka ha nēbu ya, unu onwe-unu gēsi kwa n'ebe unu nọ bulie ije, we nējeso ya. 4 Nání, ókè gādi n'etiti unu na ya, dika nnù cubit ise n'ọtùtù: unu abiarula nso ya, ka unu we mara uzọ nke unu gēsi je; n'ihi na unu agabigaghi n'uzọ a na mb͕e gara aga. 5 Joshua we si ndi Israel, Donu onwe-unu nsọ: n'ihi na echi ka Jehova gēme ihe-ebube di iche iche n'etiti unu. 6 Joshua we gwa ndi-nchu-àjà okwu, si, Bulienu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu-ahu, gabiga n'iru ndi Israel. Ha we bulie ib͕e ọb͕ub͕a-ndu ahu, we nēje n'iru ndi Israel. 7 Jehova we si Joshua, Ta ka M'gāmalite ime ka i di uku n'anya Israel nile, ka ha we mara na otú M'nọyere Moses, otú a ka M'gānọyere gi. 8 Gi onwe-gi gēnye kwa ndi-nchu-àjà ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu ahu iwu, si, Mb͕e unu gābiaru nsọtu miri Jọdan, unu gēguzo na Jọdan. 9 Joshua we si umu Israel, Bianu nso ebe a, nuru okwu nile nke Jehova, bú Chineke-unu. 10 Joshua we si, Nka ka unu gēji mata na Chineke Nke di ndu nọ n'etiti unu, Ọ ghaghi kwa inapu ha ala-ha n'iru unu, bú ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Haivait, na ndi-Perizait, na ndi-Giagashait, na ndi-Amorait, na ndi Jebus. 11 Le, ib͕e ọb͕ub͕a-ndu nke Onye-nwe uwa nile nāgabiga n'iru unu nime Jọdan. 12 Ma ub͕u a, werenu m'onwe-unu ndikom iri na abua sitere n'ebo nile nke Israel, otù nwoke otù nwoke diri ebo ọ bula. 13 Ọ gēru kwa, mb͕e ọbu-ukwu ndi-nchu-àjà ndi nēbu ib͕e Jehova, bú Onye-nwe uwa nile, gēzu ike nime miri Jọdan, na agēbipu miri Jọdan, bú miri nke nēsi n'elu rida; ha gēguzo kwa n'otù obo. 14 O rue, mb͕e ndi Israel siri n'ulo-ikwū nile ha bulie ije, igabiga Jọdan, ndi-nchu-àjà nēbu kwa ib͕e ọb͕ub͕a-ndu ahu n'iru ndi Israel; 15 mb͕e ndi nēbu ib͕e ahu biaru-kwa-ra Jọdan, mb͕e ndi-nchu-àjà ndi, nēbu ib͕e ahu zọyere ukwu-ha nime nsọtu miri, (n'ihi na Jọdan nēruchi usọ-ya nile ubọchi nile nke owuwe-ihe-ubi, ) 16 na miri ahu nke nēsi n'elu rida guzoro, we bilie n'otù obo, n'ebe di anya nke-uku, n'Adam, bú obodo nke di n'akuku Zaretan: ebìpusi-kwa-ra miri nke nērudata rue osimiri Araba, bú Oké Osimiri Nnú: ndi Israel we gabiga na ncherita-iru Jeriko. 17 Ndi-nchu-aja ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova we guzo n'ala-akọrọ n'etiti Jọdan, Israel nile we nagabiga n'ala-akọrọ, rue mb͕e mba ahu nile gabigasiri Jọdan.

Joshua 4

1 O rue, mb͕e mba ahu nile gabigasiri Jọdan, na Jehova gwara Joshua okwu, si, 2 Werenu n'onwe-unu ndikom iri na abua sitere na ndim, otù nwoke otù nwoke n'ebo ọ bula, 3 nye-kwa-nu ha iwu, si, Bupuru onwe-unu n'ebe a, n'etiti Jọdan, n'ebe-nguzo siri ike nke ukwu ndi-nchu-àjà, nkume iri na abua, bubiga ha n'etiti unu, dọba ha n'ọnọdu-abali ahu, ebe unu gānọ abali ta. 4 Joshua we kpọ ndikom iri na abua ahu, ndi o doziworo site n'umu Israel, otù nwoke otù nwoke site n'ebo ọ bula: 5 Joshua we si ha, Gabiganu n'iru ib͕e Jehova, bú Chineke-unu, rue etiti Jọdan, buliere onwe-unu, nwoke ọ bula otù nkume, tukwasi n'elu ubu-ya, dika ọnu-ọgugu ebo umu Israel si di: 6 ka nka we buru ihe-iriba-ama n'etiti unu, mb͕e umu-unu gāju ajuju n'ọdi-n'iru, si, Gini bu isi nkume ndia n'ebe unu nọ? 7 unu gāsi kwa ha, N'ihi na ebipuru miri Jọdan n'iru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova; mb͕e ọ gabigara Jọdan, ebipuru miri Jọdan: nkume ndia gābu-kwa-ra umu Israel ihe-ncheta rue mb͕e ebighi-ebi. 8 Umu Israel we me otú a, dika Joshua nyere ha iwu, ha we bupu nkume iri na abua n'etiti Jọdan, dika Jehova gwara Joshua okwu, dika ọnu-ọgugu ebo umu Israel si di; ha we bubiga ha n'etiti ha rue ọnọdu-abali-ha, we dọba ha n'ebe ahu. 9 Joshua we guzo nkume iri na abua n'etiti Jọdan, bú ebe-nguzo siri ike nke ukwu ndi-nchu-àjà ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu: ha we di n'ebe ahu, rue ta. 10 Ndi-nchu-àjà ndi nēbu ib͕e ahu nēguzo kwa n'etiti Jọdan, rue mb͕e emezuru okwu ahu nile nke Jehova nyere Joshua n'iwu igwa ndi Israel, dika ihe ahu nile si di nke Moses nyere Joshua n'iwu: ndi Israel we me ngwa gabiga. 11 O rue, mb͕e ndi Israel nile gabigasiri, na ib͕e Jehova gabigara, ya na ndi-nchu-àjà, n'iru ndi Israel. 12 Umu Reuben, na umu Gad, na nkera ebo Manase, we gabiga n'iru umu Israel, chiri ihe-ekike-agha, dika Moses gwara ha okwu: 13 dika orú nnù uzọ ise, ndi ejikere nke usu-ndi-agha, gabigara n'iru Jehova ibu agha, rue ala ihe nādighi nke Jeriko. 14 N'ubọchi ahu ka Jehova mere Joshua ka ọ di uku n'anya Israel nile; ha we tua egwu ya, dika ha turu egwu Moses, ubọchi nile nke ndu-ya. 15 Jehova we gwa Joshua okwu, si, 16 Nye ndi-nchu-àjà ndi nēbu ib͕e ihe-àmà iwu, ka ha si na Jọdan rigota. 17 Joshua we nye ndi-nchu-àjà iwu, si, Sinu na Jọdan rigota. 18 O rue, mb͕e ndi-nchu-àjà ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova siri n'etiti Jọdan rigota, mb͕e ndi-nchu-àjà sepuru ọbu-ukwu-ha rue ala-akọrọ, na miri Jọdan laghachiri n'ọnọdu-ya, we ruchie akuku-ya nile, dika na mb͕e gara aga. 19 Ndi Israel we si na Jọdan rigota n'ubọchi nke-iri nke ọnwa mbu, má ulo-ikwū-ha na Gilgal, na nsọtu ọwuwa-anyanwu Jeriko. 20 Nkume iri na abua ahu, nke ha si na Jọdan were, Joshua we guzo ha na Gilgal. 21 Ọ we gwa umu Israel okwu, si, Mb͕e umu-unu gāju ndi bu nna-ha ajuju n'ọdi-n'iru, si, Gini bi isi nkume ndia? 22 Unu gēme kwa ka umu-unu mara, si, N'ala-akọrọ ka Israel gabigara Jọdan nka. 23 N'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, mere ka miri Jọdan takọrọ n'iru unu, rue mb͕e unu gabigara, dika Jehova, bú Chineke-unu, mere Oké Osimiri Uhie, nke O mere ka ọ takọrọ n'iru ayi, rue mb͕e ayi gabigara: 24 ka ndi nile nke uwa we mara aka Jehova, na ike ka ọ di; ka ha we tua egwu Jehova, bú Chineke-unu, ubọchi nile.

Joshua 5

1 O rue, mb͕e eze nile nke ndi-Amorait, ndi bi n'ofè Jọdan n'akuku ọdida-anyanwu, na eze nile nke ndi Kenean, ndi bi n'akuku oké osimiri, nuru na Jehova mereri ka miri Jọdan takọrọ n'iru umu Israel, rue mb͕e ayi gabigasiri, na obi lọrọ ha miri, mọ adighi kwa nime ha ọzọ, n'ihi umu Israel. 2 Na mb͕e ahu Jehova siri Joshua, Mere onwe-gi mma ọ́mú, bìe umu Israel úgwù ọzọ nke ub͕ò abua. 3 Joshua we mere onwe-ya mma ọ́mu, bìe umu Israel úgwù na Gibeat-ha-aralot. 4 Nka bu kwa ihe kpatara Joshua ji bìe úgwù: ndi Israel nile ndi nēsi n'Ijipt puta, ndi bu ndikom, bú ndikom agha nile, nwuru n'ọzara n'uzọ, mb͕e ha siri n'Ijipt puta. 5 N'ihi na ndi ebìri úgwù ka ha bu, bú ndi nile putara n'Ijipt: ma ndi nile amuru n'ọzara n'uzo mb͕e ha siri n'Ijipt puta, ha ebìghi ha úgwù. 6 N'ihi na ọgu arọ abua ka umu Israel jere ije n'ọzara, rue mb͕e mba ahu nile gwusiri, bú ndikom agha ahu ndi nēsi n'Ijipt puta, n'ihi na ha egeghi nti olu Jehova: ndi Jehova ṅuru iyi na Ọ gaghi-ekwe ka ha hu ala ahu nke Jehova ṅuru ndi bu nna-ha iyi na Ọ gēnye ayi, bú ala miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya. 7 Ma umu-ha, ndi O mere ka ha bilie n'ọnọdu ha, ndi ahu ka Joshua biri úgwù: n'ihi na ndi anēbighi úgwù ka ha bu, n'ihi na ha ebìghi ha úgwù n'uzọ. 8 O rue, mb͕e ha bìzuru mba ahu nile úgwù, na ha nọduru n'ọnọdu-ha n'ọmuma-ulo-ikwū, rue mb͕e aru-ha di ike. 9 Jehova we si Joshua, Ta ka M'kpochapuworo ihe-ita-uta nke Ijipt n'aru unu. Ewe kpọ aha ebe ahu Gilgal, rue ta. 10 Umu Israel we ma ulo-ikwū-ha na Gilgal; ha we me ememe ngabiga n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu n'anyasi, n'ala ihe nādighi nke Jeriko. 11 Ha we rie ufọdu nime ihe mìrì n'ala ahu n'echi nke ngabiga ahu, bú achicha ekoghi-eko na ọka aṅara n'ọku, n'otù ubọchi ahu. 12 Manna we kwusi n'echi-ya, mb͕e ha riri ufọdu nime ihe mìrì n'ala ahu; umu Israel enweghi kwa manna ọzọ; ha we rie ihe-ọmume ala Kenean n'arọ ahu. 13 O rue, mb͕e Joshua nọ n'akuku Jeriko, na o weliri anya-ya abua, we hu, ma, le, otù nwoke nēguzo na ncherita-iru ya, mma-agha-ya amiputara amiputa di n'aka-ya: Joshua we jekuru ya, si ya, Ọ̀ bu ayi ka i diri ma-ọbu ndi nēmegide ayi? 14 Ọ si, É-è; kama mu onwem bu onye-isi usu-ndi-agha Jehova; ub͕u a ka m'biaworo. Joshua we da kpue iru-ya n'ala, kpọ isi ala, si ya, Gini ka onye-nwem nāgwa orù-ya? 15 Onye-isi usu-ndi-agha Jehova we si Joshua, Yipu akpukpọ-ukwu-gi n'ukwu-gi; n'ihi na ebe nke gi onwe-gi nēguzo n'elu ya, nsọ ka ọ di. Joshua we me otú a.

Joshua 6

1 (Ma Jeriko mechiri ọnu-uzọ-ama-ya, ewe mechibido ya uzọ n'ihi umu Israel: ọ dighi onye nāpu n'èzí, ọ dighi kwa onye nābà nime. ) 2 Jehova we si Joshua, Le, enyewom Jeriko, na eze-ya, na ndi-dike nile, bú dinkpà, n'aka-gi. 3 Unu gāb͕a obodo ahu buruburu, ndikom agha nile, nēje obodo ahu buruburu otù ub͕ò. Otú a ka i gēme ubọchi isi. 4 Ndi-nchu-aja asa gēbu kwa opì-ike oké uda asa n'iru ib͕e ahu: ma n'ubọchi nke-asa unu gāb͕a obodo ahu buruburu ub͕ù asa, ndi-nchu-aja gāfù kwa opì-ike asa ahu. 5 Ọ gēru kwa, mb͕e ha gēwere mpi oké uda fù ọfufu-opì di anya, mb͕e unu gānu kwa olu opì-ike ahu, na ndi nkem nile gēti oké nkpu; mb͕idi obodo ahu gāda kwa n'okpuru ya, ndim gārigo kwa, nwoke ọ bula na ncherita-iru ya. 6 Joshua nwa Nun we kpọ ndi-nchu-àjà, si ha, Būrunu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu ahu, ndi-nchu-àjà asa gēbu kwa opì-ike oké uda asa n'iru ib͕e Jehova. 7 Ha we si ndi Israel, Gabiganu, b͕a obodo ahu buruburu, ndi ejikere gāgabiga kwa n'iru ib͕e Jehova. 8 O rue, mb͕e Joshua gwara ndi Israel okwu, ndi-nchu-àjà asa ndi nēbu opì-ike oké uda asa ahu n'iru Jehova we gabiga, we nāfù opì-ike asa ahu: ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova we nējeso ha n'azu. 9 Ndi ejikere we nēje n'iru ndi-nchu-àjà ndi nāfù opì-ike asa ahu, ndi nāchikọta achikọta nējeso kwa ib͕e ahu n'azu, ndi-nchu-àjà nāfù opì-ike asa ahu ka ha nēje. 10 Joshua we nye ndi Israel iwu, si, Unu etila nkpu, unu ekwe-kwa-la ka anu olu-unu, okwu ọ bula agaghi-esi kwa n'ọnu-unu puta, rue ubọchi m'gāsi unu, Tienu nkpu; unu ewe tie nkpu. 11 Ọ we me ka ib͕e Jehova b͕a obodo ahu buruburu, nēje ya buruburu otù ub͕ò: ha we bata n'ọmuma-ulo-ikwū, nọ ọnọdu-abali n'ọmuma-ulo-ikwū. 12 Joshua we bilie n'isi-ututu, ndi-nchu-àjà we būru ib͕e Jehova. 13 Ndi-nchu-àjà asa ahu ndi nēbu opì-ike oké uda asa ahu n'iru ib͕e Jehova nējegide, nāfù kwa opì-ike asa ahu: ndi ejikere nēje kwa n'iru ha; ndi nāchikọta achikọta nējeso kwa ib͕e Jehova n'azu, ndi-nchu-àjà nāfù opì-ike asa ahu ka ha nēje. 14 N'ubọchi nke-abua ha we b͕a obodo ahu buruburu otù ub͕ò, we laghachi n'ọmuma-ulo-ikwū: otú a ka ha mere ubọchi isi. 15 O rue n'ubọchi nke-asa, na ha biliri n'isi-ututu mb͕e chi nābọ, we b͕a obodo ahu buruburu n'otù uzọ ahu ub͕ò asa: nání, n'ubọchi ahu ha b͕ara obodo ahu buruburu ub͕ò asa. 16 O rue, n'ub͕ò nke-asa, mb͕e ndi-nchu-àjà fùru opì-ike asa ahu, na Joshua siri ndi Israel, Tienu nkpu; n'ihi na Jehova enyewo unu obodo ahu. 17 Obodo ahu gābu ihe ewezugara nye Jehova, ya onwe-ya, na ihe nile di nime ya: nání Rehab, bú nwayi nākwa iko, gādi ndu, ya onwe-ya na ndi nile ya na ha nọ n'ulo, n'ihi na o zobere ndi-ozi ndi ayi zigara. 18 Ma otú ọ di, unu onwe-unu debenu onwe-unu ka unu ghara imetu ihe ewezugara nye Jehova aka, ka unu we ghara iwere ihe ahu ewezugara, mb͕e unu wezugasiri ya; unu ewe me ka ọmuma-ulo-ikwū Israel buru ihe ewezugara ka ebibie ya, unu ewe mekpa ya aru. 19 Ma ọla-ọcha nile, na ọla-edo, na ihe nile nke ọla na ígwè, nsọ ka ha diri Jehova: ha gābà n'ulo-àkù Jehova. 20 Ndi Israel we tie nkpu, ndi-nchu-àjà we fùa opì-ike asa ahu: o rue, mb͕e ndi Israel nuru olu opì-ike, na ndi Israel tiri oké nkpu, mb͕idi ahu we da n'okpuru ya, ndi Israel we rigo n'obodo ahu, nwoke ọ bula na ncherita-iru ya, ha we were obodo ahu. 21 Ha we were ọnu mma-agha wezuga ihe nile di n'obodo ahu ka ebibie ya, ma nwoke ma nwayi, ma nwata ma okenye, na ehi, na aturu, na inyinya-ibu. 22 Joshua we si ndikom abua ahu ndi nēledori ala ahu, Banu n'ulo nwayi ahu nākwa iko, menu ka nwanyi ahu na ihe nile o nwere puta, dika unu ṅuru ya iyi. 23 Umu-okorọbia ahu, bú ndi-nledo, we ba nime, me ka Rehab, na nna-ya, na nne-ya, na umu-nne-ya, na ihe nile ọ nwere, puta, ab͕uru-ya nile ka ha me-kwa-ra ka ha puta; ha we me ka ha nọdu n'azu ọmuma-ulo-ikwū Israel. 24 Ha we sure obodo ahu n'ọku, na ihe nile nke di nime ya: nání ọla-ọcha, na ọla-edo, na ihe nile nke ọla na ígwè, ka ha tiyere n'ulo-àkù Jehova. 25 Ma Joshua mere ka Rehab, bú nwayi nākwa iko, na ulo nna-ya, na ihe nile ọ nwere, di ndu; ọ we biri n'etiti Israel, rue ta; n'ihi na o zobere ndi-ozi ahu, ndi Joshua zigara iledo Jeriko. 26 Joshua we b͕a ha iyi na mb͕e ahu, si, Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu n'iru Jehova, nke gēbili wue obodo Jeriko a: ọkpara-ya ka ọ gēwere tọ ntọ-ala-ya, nwa-nwoke-ya nke-ntà ka ọ gēwere kwa guzo ọnu-uzọ-ama-ya ọtọ. 27 Jehova we nọyere Joshua: akukọ-ya we di n'ala ahu nile.

Joshua 7

1 Ma umu Israel mekpuru ihe-nmekpu n'ihe ahu ewezugara nye Jehova; n'ihi na Ekan nwa Kami, nwa Zabdi, nwa Zera, nke ebo Juda, were ufọdu nime ihe ahu ewezugara nye Jehova; iwe Jehova we di ọku megide umu Israel. 2 Joshua we si na Jeriko ziga ndikom ije Ai, nke di nso Bet-even, n'akuku Iru-anyanwu nke Bet-el, o we gwa ha okwu, si, Rigonu, ledo ala ahu. Ndikom ahu we rigo, ledo Ai. 3 Ha we laghachikuru Joshua, si ya, Ka ndi Israel nile ghara irigo; ka ihe ra ka nnù ndikom ise, ma-ọbu ihe ra ka nnù ndikom asa na ọgu iri, rigo, tib͕ue Ai; emela ka ndi Israel nile dọb͕ue onwe-ha n'ọlu iru ebe ahu; n'ihi na madu ole-na-ole ka ha di. 4 Ihe ra ka nnù ndikom asa na ọgu iri we rigo n'ebe ahu site na ndi Israel: ha we b͕alaga n'iru ndikom Ai. 5 Ndikom Ai we tib͕ue ihe ra ka orú madu na iri na isi sitere na ha: ha we si n'iru ọnu-uzọ-ama chugide ha rue Shebarim, we tib͕ue ha na nrida ahu: obi we lọ ndi Israel miri, we ghọ miri miri. 6 Joshua we dọwa uwe-nb͕okwasi-ya nile, da kpue iru-ya n'ala n'iru ib͕e Jehova rue anyasi, ya onwe-ya na ndi-okenye Israel; ha we kpokwasi ájá n'isi-ha. 7 Joshua we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova, n'ìhi gini ka I meworo ka ndi nka gabiga Jọdan ma-ọli, inye ayi n'aka ndi-Amorait, ime ka ayi la n'iyì? ọ gādi ayi nọ̄ nma ma asi na ayi kwere we biri n'ofè Jọdan! 8 Biko, Onye-nwe-ayi, gini ka m'gēkwu, mb͕e Israel b͕akutasiri azu-ha n'iru ndi-iro-ha? 9 Ndi Kenean na ndi nile bi n'ala nka gānu kwa ya, we b͕a ayi buruburu, bipu aha-ayi n'uwa: ọ̀ bu kwa gini ka I gēmere aha uku Gi? 10 Jehova we si Joshua, Gi bilie; n'ìhi gini bu nka na i nāda kpu iru-gi n'ala? 11 Israel emehiewo; ọzọ kwa, ha agabigawo ọb͕ub͕a-ndum nke M'nyere ha n'iwu: ọzọ kwa, ha ewerewo ufọdu nime ihe ewezugara nyem; ọzọ kwa, ha ezuwo ori, ọzọ kwa, ha aghọwo aghughọ, ọzọ kwa, ha etiyewo ya n'ihe-ha. 12 Umu Israel apughi kwa iguzosi ike n'iru ndi-iro-ha, ha nāb͕akuta azu n'iru ndi-iro-ha, n'ihi na ha aghọwo ihe ewezugara ka ebibie ha: M'gaghi-anọyere unu ọzọ, ma ọ buru na unu ekpochapughi ihe ahu ewezugara nyem n'etiti unu. 13 Bilie, do ndim nsọ, si, Donu onwe-unu nsọ bayere echi: n'ihi na otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Ihe ewezugara nyem di n'etiti gi, Israel: i pughi iguzosi ike n'iru ndi-iro-gi, rue mb͕e unu gēwezuga n'etiti onwe-unu ihe ahu ewezugara nyem. 14 Agēme kwa ka unu biarue nso n'ututu n'ebo nile unu: o gēru kwa, na ebo ahu nke Jehova gānwude gābiaru nso n'ab͕uru nile ya; ab͕uru ahu nke Jehova gānwude gābiaru kwa nso n'ulo-ya nile; ulo ahu nke Jehova gānwude gābiaru kwa nso na ndikom-ya. 15 Ọ gēru kwa, na onye anwudere ya na ihe ahu ewezugara nye Jehova, agēsure ya n'ọku, ya onwe-ya na ihe nile o nwere: n'ihi na ọ gabigawo ọb͕ub͕a-ndu Jehova, na n'ihi na o mewo ihe-nzuzu n'Israel. 16 Joshua we bilie n'isi-ututu, me ka Israel biarue nso n'ebo nile ha; ewe nwude ebo Juda: 17 o we me ka ab͕uru Juda biarue nso; ọ we nwude ab͕uru ndi Zera: o we me ka ab͕uru ndi Zera biarue nso na ndikom-ya; ewe nwude Zabdi: 18 o we me ka ulo-ya biarue nso na ndikom-ya; ewe nwude Ekan, nwa Kami, nwa Zabdi, nwa Zera, nke ebo Juda. 19 Joshua we si Ekan, Nwam, biko, nye Jehova, bú Chineke Israel, nsọpuru, nye kwa Ya ekele; biko, gosikwam ihe i meworo; ezopula ya n'ebe m'nọ. 20 Ekan we za Joshua, si, N'ezi-okwu mu onwem emehiewo megide Jehova, bú Chineke Israel, otú a na otú a ka m'mewo-kwa-ra: 21 m'we hu n'etiti ihe-nkwata otù ezi uwe-nwuda nke Shaina, na ọgu shekel ọla-ọcha iri, na otù nkpirikpi ọla-edo nke ọtùtù-ya di ọgu shekel abua na iri, m'we nwe anya-uku n'ebe ha di, m'we chiri ha; ma, le, ezoworo ha n'ala n'etiti ulo-ikwūm, ọla-ọcha ahu di kwa n'okpuru ya. 22 Joshua we ziga ndi-ozi, ha we b͕arue ulo-ikwū-ya; ma, le, ezoro ya n'ulo-ikwū-ya, ọla-ọcha ahu di kwa n'okpuru ya. 23 Ha we si n'ulo-ikwū ahu chiri ha, chitara ha Joshua, chita-kwa-ra ha umu Israel nile; ha we wusa ha n'iru Jehova. 24 Joshua, ya na Israel nile, we were Ekan nwa Zera, na ọla-ọcha ahu, na uwe-nwuda ahu, na nkpirikpi ọla-edo ahu, na umu-ya ndikom, na umu-ya ndinyom, na ehi-ya, na inyinya-ibu-ya, na ìgwè ewu na aturu-ya, na ulo-ikwū-ya, na ihe nile o nwere: ha we me ka ha rigorue Ndagwurugwu Ekoa. 25 Joshua we si, Gini mere i mekpaworo ayi aru? Jehova gēmekpa gi aru ta. Israel nile we were nkume ub͕ue ya; ha we sure ha n'ọku, were kwa nkume tub͕ue ha. 26 Ha we guzo n'elu ya oké obo nkume, rue ta; Jehova we si n'idi-ọku nke iwe-Ya chigharia. N'ihi ya akpọrọ aha ebe ahu, Ndagwurugwu Ekoa, rue ta.

Joshua 8

1 Jehova we si Joshua, Atula egwu, atu-kwa-la ujọ: chiri ndi-agha nile tiyere onwe-gi, bilie, rigorue Ai: le, enyewom eze Ai, na ndi-ya, na obodo-ya, na ala-ya, n'aka-gi: 2 i gēme kwa Ai, me kwa eze-ya, dika i mere Jeriko, me kwa eze-ya: nání, na unu gālutara onwe-unu n'agha ihe-nkwata-ya, na anu-ulo-ya: doro onwe-gi ndi nēru nbì megide obodo ahu n'azu ya. 3 Joshua we bilie, ya na ndi-agha nile, irigoru Ai: Joshua we rọputa orú nnù ndikom uzọ atọ na nnù ndikom iri-na-ise, ndi-dike, bú ndi-dìnkpà, o we zipu ha n'abali. 4 O we nye ha iwu, si, Lenu, unu onwe-unu nēru nbì megide obodo ahu, n'azu obodo: unu esila n'obodo ahu je n'ebe di anya nke-uku, buru-kwa-nu ndi nọ na njikere, unu nile: 5 mu onwem, na ndi nile mu na ha nọ, gābiaru obodo ahu nso: ọ gēru kwa, mb͕e ha gāputa izute ayi, dika na mb͕e mbu, na ayi gāb͕alaga n'iru ha; 6 ha gāputa n'azu ayi, rue mb͕e ayi gādọpu ha n'obodo; n'ihi na ha gāsi, Ha nāb͕alaga n'iru ayi, dika na mb͕e mbu; ayi gāb͕alaga kwa n'iru ha: 7 unu onwe-unu gēsi kwa n'oruru-nbì ahu bilie, nweta obodo ahu: n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, gēnye ya n'aka-unu. 8 Ọ gēru kwa, mb͕e unu wereworo obodo ahu, na unu gēsu obodo ahu ọku; dika okwu Jehova si di, otú a ka unu gēme: lenu, enyewom unu iwu. 9 Joshua we zipu ha: we je n'oruru-nbì ahu, we nọdu n'etiti Bet-el na Ai, n'akuku Ọdida-anyanwu Ai: Joshua we nọ ọnọdu-abali ahu n'etiti ndi Israel. 10 Joshua we bilie n'isi-ututu, lekọta ndi Israel, rigo, ya onwe-ya na ndi-okenye Israel, n'iru ndi Israel, rue Ai. 11 Ndi nile, bú ndi-agha ndi ya na ha nọ, we rigo, biarue nso, bia na ncherita-iru obodo ahu, ma ulo-ikwū-ha n'akuku Ugwu nke Ai: ma ndagwurugwu di n'etiti ya na Ai. 12 O we chiri ihe ra ka nnù ndikom iri-na-abua na ọgu iri, do ha n'oruru-nbì n'etiti Bet-el na Ai, n'akuku Ọdida-anyanwu obodo ahu. 13 Ndi Israel we do ọmuma-ulo-ikwū ahu nile nke di n'akuku Ugwu obodo ahu, na ndi-ha ndi nēche anwu n'akuku Ọdida-anyanwu obodo ahu; Joshua we je n'etiti ndagwurugwu ahu n'abali ahu. 14 O rue, mb͕e eze Ai huru nke ahu, na ndikom obodo-ya mere ngwa, bilie n'isi-ututu, pua izute Israel ibu agha, ya onwe-ya na ndi-ya nile, na mb͕e akara àkà, n'iru Araba ahu; ma ya onwe-ya amaghi na ndi nēru nbì di megide ya n'azu obodo-ya. 15 O we di ka anētib͕u Joshua na Israel nile n'iru ha, ha we b͕alaga n'uzọ ọzara. 16 Ewe tikue ndi nile nọ n'obodo ahu nkpu ichu ha n'azu: ha we chua Joshua n'azu, ewe dọpu ha n'obodo. 17 Ọ dighi kwa nwoke fọduru na Ai ma-ọbu na Bet-el, nke nāpughi ichu Israel: ha we rapu obodo ahu ka o ghere oghe, we chua Israel n'azu. 18 Jehova we si Joshua, Zo nkpunkpu ube nke di n'aka-gi n'ebe Ai di; n'ihi na n'aka-gi ka M'gēnye ya. Joshua we zo nkpunkpu ube ahu nke di n'aka-ya n'ebe obodo ahu di. 19 Ndi nēru nbì we si n'ọnọdu-ha bilie ngwa ngwa, we b͕a ọsọ mb͕e o setiri aka-ya, ha we ba n'obodo, were ya; ha we me ngwa sue obodo ahu ọku. 20 Ndikom Ai we le anya n'azu ha, hu, ma, le, anwuru-ọku obodo-ha rigoro rue elu-igwe, ike adighi kwa nime ha ib͕alaga otù uzọ ọzọ: ndi Israel ndi nāb͕alaga n'ọzara we chigharia imegide ndi nāchu ha. 21 Joshua na Israel nile-hukwara na ndi nēru nbì ewerewo obodo ahu, hu kwa na anwuru-ọku obodo arigowo n'elu, ha we laghachi, tib͕ue ndikom Ai. 22 Ndi nēru nbì si kwa n'obodo puta izute ha; ha we nọ n'etiti Israel, ndi si n'ọzara nọ n'otù akuku, ndi si n'obodo nọ kwa n'akuku ọzọ: ha we tib͕ue ha rue mb͕e ọ dighi onye fọduru ma-ọbu onye b͕apuru ab͕apu arapuru ha. 23 Ha we were eze Ai na ndu, me ka ọ biarue Joshua nso. 24 O rue, mb͕e Israel b͕usiri ndi nile bi na Ai n'ọhia, bú n'ọzara ebe ha churu ha, mb͕e ha nile dasiri n'ọnu mma-agha, rue mb͕e ha gwusiri, na Israel nile laghachiri na Ai, ọnu mma-agha tib͕ue ya. 25 Ndi nile ndi dara n'ubọchi ahu, ma nwoke ma nwayi, we di orú nnù madu na nnù iri, bú ndikom nile nke Ai. 26 Ma Joshua eseghachighi aka-ya, nke o ji zo nkpunkpu ube ahu, rue mb͕e o wezugasiri ndi nile bi na Ai ka ebibie ha. 27 Nání na Israel lutara n'onwe-ha anu-ulo na ihe-nkwata nke obodo ahu n'agha, dika okwu Jehova si di nke O nyere Joshua n'iwu. 28 Joshua we sure Ai ọku, do ya ka ọ buru obo ebighi-ebi, bú ebe tọb͕ọrọ n'efu, rue ta. 29 Ọ we kwuba eze Ai n'osisi rue mb͕e anyasi: ma mb͕e anyanwu nāda Joshua nyere iwu, ha we si n'osisi weda ozu-ya, tuda ya n'oghere ọnu-uzọ-ama obodo, guzo n'elu ya oké obo nkume, rue ta. 30 Mb͕e ahu Joshua wuru ebe-ichu-àjà nye Jehova, bú Chineke Israel, n'ugwu Ibal, 31 dika Moses, bú orù Jehova, nyere umu Israel iwu, dika edeworo ya n'akwukwọ iwu Moses, bú ebe-ichu-àjà nkume zuru okè, nke ọ nēmeghi ka ígwè ga n'elu ha: ha we surere Jehova àjà-nsure-ọku n'elu ya, chu kwa àjà-udo. 32 O we dekwasi na nkume ahu n'ebe ahu ndeputa iwu Moses, nke o dere n'akwukwọ n'iru umu Israel. 33 Israel nile, na ndi-okenye-ha, na ndi-ọchi-agha-ha, na ndi-ikpé-ha, nēguzo kwa n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ nke ib͕e ahu na ncherita-iru ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, ma ọbìa ma onye amuru n'ala; nkera-ha na ncherita-iru ugwu Geraizim, nkera-ha ọzọ na ncherita-iru ugwu Ibal; dika Moses, bú orù Jehova, nyere iwu na mbu, igọzi ndi Israel. 34 Emesia o we gua okwu nile nke iwu ahu, ma ngọzi ma nkọcha, dika ihe nile si di nke edeworo n'akwukwọ iwu ahu. 35 Ọ dighi okwu ọ bula n'ihe nile nke Moses nyere n'iwu nke Joshua nāgughi n'iru nkpọkọta nile nke Israel, na ndinyom, na umu-ntakiri, na ndi-ọbìa ndi nēje ije n'etiti ha.

Joshua 9

1 O rue, mb͕e eze nile ndi bi n'ofè Jọdan, n'ugwu, na n'ebe di ala ala, na n'ọnu-miri nile nke oké osimiri uku ahu na ncherita-iru Lebanon, ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus, nuru ya; 2 na ha chikọtara onwe-ha, ibuso Joshua na ibuso Israel agha, n'otù ọnu. 3 Ma ndi bi na Gibeon nuru ihe nke Joshua mereri Jeriko me kwa Ai, 4 ha we were aghughọ me ihe, ọbuná ndi ahu, ha we je, me dika ndi ezìri ozi, ha we chiri akpa kara nká n'elu inyinya-ibu-ha, na karama-akpukpọ manya-vine, nke kara nká, dọwa kwa adọwa, ekezi-kwa-ra ekezi; 5 akpukpọ-ukwu kara nká, nke ab͕ara ab͕a, di kwa n'ukwu-ha, uwe kara nká di kwa n'aru ha; achicha nile nke ihe ha nēri n'uzọ kpọ-kwa-ra nku, ma kwa ebu. 6 Ha we jekuru Joshua rue ọmuma-ulo-ikwū na Gilgal, si ya, si kwa ndikom Israel, Ala di anya ka ayi si bia: ma ub͕u a ka ayi na unu b͕a ndu. 7 Ndikom Israel we si ndi-Haivait, Eleghi anya n'etiti ayi ka unu onwe-unu nēbi; àyi na unu gēsi kwa aṅa b͕a ndu? 8 Ha we si Joshua, Ndi-orù-gi ka ayi bu. Joshua we si ha, Òle ndi ka unu bu? òle ebe unu si bia kwa? 9 Ha we si ya, Ala di anya nke-uku ka ndi-orù-gi si bia n'ihi aha Jehova, bú Chineke-gi: n'ihi na ayi anuwo akukọ- Ya, na ihe nile O mere n'Ijipt, 10 na ihe nile O mere eze abua nke ndi-Amorait, ndi biri n'ofè Jọdan, bú nke O mere Saihon, bú eze Heshbon, me kwa Og, bú eze Beshan, nke nọ n'Ashtarot. 11 Ndi-okenye-ayi na ndi nile bi n'ala-ayi we gwa ayi okwu, si, Werenu ihe unu gēri n'uzọ n'aka-unu, je izute ha, si ha, Ndi-orù-unu ka ayi bu: ma ub͕u a, ka ayi na unu b͕a ndu. 12 Achicha-ayi a, mb͕e ọ di ọku ka ayi weputara ya n'ulo-ayi ibu ihe ayi gēri n'uzọ n'ubọchi ayi putara ijekuru unu; ma ub͕u a, le, ọ kpọwo nku, ma kwa ebu: 13 karama-akpukpọ manya-vine ndia, nke ayi b͕ajuru, di kwa ọhu; ma, le, ha dọwara adọwa: uwe-ayi na akpukpọ-ukwu-ayi ndi a akawo kwa nká site n'ije di ogologo nke-uku. 14 Ndikom ahu we nara ufọdu nime ihe-oriri-uzọ-ha, ha ajughi kwa ase n'ọnu Jehova. 15 Joshua we me ka udo di n'etiti ha na Israel, ya na ha we b͕a ndu, ka ọ kwe ka ha di ndu: ndi-isi nzukọ Israel we ṅuara ha iyi. 16 O rue, n'ọgwugwu ubọchi atọ mb͕e ha na ha b͕asiri ndu, na ha nuru na ndi-ab͕ata-obi-ha ka ha bu, na ọ bu kwa n'etiti ha ka ndi ahu nēbi. 17 Umu Israel we bilie ije, biarue obodo nile ha n'ubọchi nke-atọ. Ma obodo-ha bu Gibeon, na Kefira, na Beirot, na Kiriat-jearim. 18 Ma umu Israel etib͕ughi ha, n'ihí na ndi-isi nzukọ Israel ewerewo Jehova, bú Chineke Israel, ṅuara ha iyi. Nzukọ ahu nile we tamu ntamu megide ndi-isi. 19 Ndi-isi nile we si nzukọ ahu nile, Ayi onwe-ayi ewerewo Jehova, bú Chineke Israel, ṅuara ha iyi: ma ub͕u a ayi apughi imetu ha aka. 20 Nka ka ayi gēme ha, kwe kwa ka ha di ndu; ka iwe we ghara idikwasi ayi, n'ihi iyi ahu nke ayi ṅuru ha. 21 Ndi-isi we si ha, Ka ha di ndu: ha we ghọrọ nzukọ Israel nile ndi-ọwa-nkú na ndi-ose-miri; dika ndi-isi gwara ha okwu. 22 Joshua we kpọ ha, gwa ha okwu, si, N'ìhi gini ka unu ghọb͕uru-ayi, si, Ndi bi n'ebe dipuru unu anya nke-uku ka ayi bu; ma unu onwe-unu nēbi n'etiti ayi? 23 Ma ub͕u a, ndi anābu ọnu ka unu bu, agaghi-ebipu kwa n'etiti unu ndi gābu orù, ma ndi-ọwa-nkú ma ndi-ose-miri bayere ulo Chinekem. 24 Ha we za Joshua, si, N'ihi na egosiri ndi-orù-gi n'ezie na Jehova, bú Chineke-gi, nyere Moses, bú orù-Ya, iwu inye unu ala nka nile, na ikpochapu ndi nile bi n'ala nka n'iru unu; ayi we tua egwu nke-uku bayere ndu-ayi n'ihi unu, ayi we me ihe a. 25 Ma ub͕u a, le, ayi nọ n'aka-gi: dika o si di nma, dika o si zi kwa ezi n'anya-gi ime ayi, me. 26 O we me ha otú a, naputa ha n'aka umu Israel, ha eb͕ughi kwa ha. 27 Joshua we me ha n'ubọchi ahu ndi-ọwa-nkú na ndi-ose-miri bayere nzukọ Israel, baye-kwa-ra ebe-ichu-àjà Jehova, rue ta, n'ebe ahu nke Ọ gārọputa.

Joshua 10

1 O rue, mb͕e Adoni-zedek, bú eze Jerusalem, nuru na Joshua ewerewo Ai, wezuga kwa ya ka ebibie ya; dika ọ mereri Jeriko na eze-ya, otú a ka o mere Ai na eze-ya; mb͕e ọ nu-kwa-ra na ndi bi na Gibeon emewo ka ha na Israel di n'udo, ha we nọ n'etiti ha; 2 o rue, mb͕e ha nuru ya, na ha turu egwu nke-uku, n'ihi na Gibeon bu obodo uku, dika otù nime obodo ala-eze ahu, na n'ihi na ọ di uku kari Ai, ndikom-ya nile bu kwa ndi-dike. 3 Adoni-zedek, bú eze Jerusalem, we zigara Hoham, bú eze Hebron, ziga-kwa-ra Piram, bú eze Jamut, ziga-kwa-ra Jafia, bú eze Lekish, ziga-kwa-ra Debia, bú eze Eglon, ozi, si, 4 Rigokutenum, yerem aka, ka ayi tib͕u kwa Gibeon: n'ihi na ọ mere ka ya onwe-ya na Joshua na umu Israel di n'udo. 5 Eze ise ndi-Amorait, bú eze Jerusalem, na eze Hebron, na eze Jamut, na eze Lekish, na eze Eglon, we chikọta onwe-ha, rigo, ha onwe-ha na ọmuma-ulo-ikwū-ha nile, we ma ulo-ikwū-ha imegide Gibeon, we buso ya agha. 6 Ndikom Gibeon we zigara Joshua ozi rue ọmuma-ulo-ikwū rue Gilgal, si, Arala ndi-orù-gi aka; rigokute ayi ngwa ngwa, zọputa ayi, ye-kwa-ra ayi aka: n'ihi na eze nile nke ndi-Amorait ndi bi n'ugwu achikọtawo onwe-ha imegide ayi. 7 Joshua we si na Gilgal rigo, ya onwe-ya, na ndi-agha nile tiyere ya, na ndi-dike nile, bú ndi-dìnkpà. 8 Jehova we si Joshua, Atula egwu ha: n'ihi na n'aka-gi ka M'nyeworo ha; ọ dighi nwoke nime ha nke gēguzo n'iru gi. 9 Joshua we biakwasi ha na mberede; n'ihi na ogologo abali nile ka o si na Gilagal rigo. 10 Jehova we chusa ha n'iru Israel, o tib͕ue ha oké ntib͕u na Gibeon, we chusa ha n'uzọ nrigo Bet-horon, tib͕ue ha rue Azeka, ru kwa Makeda. 11 O rue, mb͕e ha si n'iru Israel b͕alaga, mb͕e ha nọ na nrida Bet-horon, na Jehova si n'elu-igwe tudakwasi ha nkume uku rue Azeka, ha we nwua: ndi nwuru na nkume ákú-miri-ígwé ahu kariri ndi umu Israel were mma-agha b͕ue. 12 Mb͕e ahu Joshua gwara Jehova okwu n'ubọchi Jehova rara ndi-Amorait nye n'iru umu Israel; o we si n'anya Israel, Anyanwu, guzo du n'elu Gibeon; Gi Ọnwa kwa, na ndagwurugwu Ajalon. 13 Anyanwu we guzo du, ọnwa guzo-kwa-ra, Rue mb͕e mba ahu bọsiri ọ́bọ̀ n'aru ndi-iro-ha. Èdeghi nka n'akwukwọ Jasha? Anyanwu we guzo n'etiti elu-igwe, o meghi kwa ngwa ida ihe ra ka otù ubọchi zuru ezu. 14 Ọ dighi kwa ubọchi di ka ubọchi ahu n'iru ya ma-ọbu n'azu ya, na Jehova gere nti olu madu: n'ihi na Jehova nēburu Israel agha. 15 Joshua we lata, ya na Israel nile, rue ọmuma-ulo-ikwū rue Gilgal. 16 Eze ise ndia we b͕alaga, zo onwe-ha n'ọb͕à na Makeda. 17 Ewe gosi Joshua, si, Achọtawo eze ise ahu, ha ezowo onwe-ha n'ọb͕à na Makeda. 18 Joshua we si, Kpọrenu nkume uku rue ọnu ọb͕à ahu, do kwa ndikom n'elu ya dika ndi-nlekọta idebe ha: 19 ma unu onwe-unu eguzola; nāchunu ndi-iro-unu n'azu, tib͕u kwa ndi-ikpe-azu n'etiti ha; unu ekwela ka ha ba n'obodo di iche iche ha: n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, enyewo ha n'aka-unu. 20 O rue, mb͕e Joshua na umu Israel tib͕usiri ha oké ntib͕u nke-uku, rue mb͕e emere ka ha gwusia, mb͕e ndi fọduru, bú ndi fọduru n'etiti ha, basi-kwa-ra n'obodo ewusiri ike, 21 na ndi Israel nile latara n'ọmuma-ulo-ikwū jekuru Joshua na Makeda n'udo: ọ dighi nwoke raghariri ire-ya megide umu Israel. 22 Joshua we si, Meghenu ọnu ọb͕à ahu, me kwa ka eze ise ndia si n'ọb͕à ahu pukutem. 23 Ha we me otú a, me ka eze ise ahu si n'ọb͕à ahu pukute ya, bú eze Jerusalem, na eze Hebron, na eze Jamut, na eze Lekish, na eze Eglon. 24 O rue, mb͕e ha mere ka eze ise ahu pukute Joshua, na Joshua kpọrọ ndikom nile nke Israel, si ndi-ọchi-agha nke ndikom agha ndi soro ya je, Bianu nso, zọkwasinu ukwu-unu n'olu eze ndia. Ha we bia nso, zọkwasi ukwu-ha n'olu-ha. 25 Joshua we si ha, Unu atula egwu, unu atu-kwa-la ujọ; dinu ike, nwe-kwa-nu ume: n'ihi na otú a ka Jehova gēme ndi-iro-unu nile ndi unu onwe-unu nēbuso agha. 26 Emesia Joshua we tib͕ue ha, me ka ha nwua, kwuba ha n'osisi ise: ha we kwugide n'elu osisi ise ahu rue anyasi. 27 O rue, na mb͕e anyanwu nāda, na Joshua nyere iwu, ha we si n'osisi ise ahu weda ha, tubà ha n'ọb͕à ahu ebe ha zoro onwe-ha, we tukwasi nkume uku n'ọnu ọb͕à ahu, rue ubọchi nke ta. 28 Joshua we were Makeda n'ubọchi ahu, were ọnu mma-agha tib͕ue ya na eze-ya; o wezugara ha na madu nile nke di nime ya ka ebibie ha, ọ dighi onye fọduru ọ rapuru: o me eze Makeda dika o mere eze Jeriko. 29 Joshua we si Makeda gabiga, ya na Israel nile, rue Libna, buso Libna agha: 30 Jehova we nye kwa ya na eze-ya n'aka Israel; o were ọnu mma-agha tib͕ue ya, na madu nile nke di nime ya; ọ dighi onye fọduru ọ rapuru nime ya; o me eze-ya dika ọ mere eze Jeriko. 31 Joshua we si na Libna gabiga, ya na Israel nile, rue Lekish, ma ulo-ikwū-ya megide ya, buso ya agha: 32 Jehova we nye Lekish n'aka Israel, o were ya n'ubọchi nke-abua, were ọnu mma-agha tib͕ue ya, na madu nile nke di nime ya, dika ihe nile si di nke o mere Libna. 33 Mb͕e ahu Horam, bú eze Gezea, rigoro iyere Lekish aka; Joshua we tib͕ue ya na ndi-ya, rue mb͕e ọ dighi onye fọduru ọ rapuru ya. 34 Joshua we si na Lekish gabiga, ya na Israel nile, rue Eglon; ha ma ulo-ikwū-ha megide ya, buso ya agha; 35 ha were ya n'ubọchi ahu, were ọnu mma-agha tib͕ue ya, madu nile nke di nime ya ka ọ wezugara ka ebibie ha n'ubọchi ahu, dika ihe nile si di nke o mere Lekish. 36 Joshua we si n'Eglon rigo, ya na Israel nile, rue Hebron; ha buso ya agha: 37 ha were ya, were ọnu mma-agha tib͕ue ya, na eze-ya, na obodo-ya nile, na madu nile nke di nime ya; ọ dighi onye fọduru ọ rapuru, dika ihe nile si di nke o mere Eglon; o wezuga ya ka ebibie ya, na madu nile nke di nime ya. 38 Joshua we laghachi, ya na Israel nile, rue Debia, buso ya agha: 39 o were ya, na eze-ya, na obodo-ya nile; ha were ọnu mma-agha tib͕ue ha, wezuga madu nile nke di nime ya ka ebibie ha; ọ dighi onye fọduru ọ rapuru: dika o mere Hebron, otú a ka o mere Debia, me kwa eze-ya; dika ọ me-kwa-ra Libna, me kwa eze-ya. 40 Joshua we tib͕ue ala ahu nile, bú ugwu, na Negeb, na ebe di ala ala, na nkpọrube nile, na eze-ha nile; ọ dighi onye fọduru ọ rapuru: o wezuga ihe nile nēku ume ka ebibie ya, dika Jehova, bú Chineke Israel, nyere iwu. 41 Joshua we si na Kedesh-banea tib͕ue ha we rue Geza, na ala Goshen nile, we rue Gibeon. 42 Eze ndia nile na ala-ha ka Joshua were n'otù mb͕e, n'ihi na Jehova, bú Chineke Israel, nēburu Israel agha. 43 Joshua we lata, ya na Israel nile, rue ọmuma-ulo-ikwū rue Gilgal.

Joshua 11

1 O rue, mb͕e Jebin, bú eze Hezoa, nuru ya, na o zigara Jobab, bú eze Madon, ziga-kwa-ra eze Shimron, ziga-kwa-ra eze Akshaf, 2 ziga-kwa-ra ndi-eze ndi nọ n'Ugwu, bú n'ugwu, na n'Araba nke di na Ndida Kinerot, na n'ebe di ala ala, na n'ebe nile di elu nke Doa n'Ọdida-anyanwu, ozi; 3 o zigara ndi Kenean n'Ọwuwa-anyanwu na n'Ọdida-anyanwu, na ndi-Amorait, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi Jebus n'ugwu, na ndi-Haivait n'okpuru Heamon n'ala Mizpa. 4 Ha we puta, ha onwe-ha na ọmuma-ulo-ikwū-ha nile tiyere ha, bú ndi bara uba, dika ájá nke di n'usọ oké osimiri n'uba, ha na inyinya na ub͕ọ-ala bara uba nke-uku. 5 Eze ndia nile we zukọ; ha we bia, makọ ulo-ikwū-ha na miri Mirom, ibuso Israel agha. 6 Jehova we si Joshua, Atula egwu n'ihi ha: n'ihi na echi dika na mb͕e a Mu onwem gāra ha nile nye ka ha buru ndi eb͕uru eb͕u n'iru Israel: nkwonkwo-ukwu inyinya nile ha ka i gēbipu, ọ bu kwa ub͕ọ-ala nile ha ka i gēsure n'ọku. 7 Joshua we bia, ya na ndi-agha nile, imegide ha n'akuku miri Mirom na mberede, we dakwasi ha. 8 Jehova we nye ha n'aka Israel, ha we tib͕ue ha, chu kwa ha rue Zaidon bara uba, ru kwa Misrefot-maim, ru kwa ndagwurugwu Mizpe n'akuku Ọwuwa-anyanwu; ha tib͕ue ha, rue mb͕e ọ dighi onye fọduru ha rapuru ha. 9 Joshua we me ha dika Jehova siri ya: o bipuru nkwonkwo-ukwu inyinya nile ha, sure kwa ub͕ọ-ala nile ha n'ọku. 10 Joshua we laghachi na mb͕e ahu, were Hezoa, were mma-agha tib͕ue eze-ya: n'ihi na Hezoa na mb͕e gara aga bu isi ala-eze ahu nile. 11 Ha were ọnu mma-agha tib͕ue madu nile nke di nime ya, ha wezugara ha ka ebibie ha: ọ dighi onye nēku ume fọduru: o sure Hezoa n'ọku. 12 Obodo nile nke ndi-eze ahu, na eze-ha nile, ka Joshua were, o were ọnu mma-agha tib͕ue ha, wezuga ha ka ebibie ha; dika Moses, bú orù Jehova, nyere iwu. 13 Nání, obodo nile nke Jehova nke nēguzo n'obo-ha, Israel esureghi ha ọku, nāgughi Hezoa nání ya; nke ahu ka Joshua surere ọku. 14 Ihe-nkwata nile nke obodo ndia, na anu-ulo-ha, umu Israel lutara ha n'agha nye onwe-ha; nání na ha were ọnu mma-agha tib͕ue madu ọ bula, rue mb͕e ha kpochapusiri ha, ha ekweghi ka onye ọ bula nēku ume fọdu. 15 Dika Jehova nyere Moses, bú orù-Ya, iwu, otú a ka Moses nyere Joshua iwu: otú a ka Joshua me-kwa-ra; o wezugaghi okwu ọ bula n'ihe nile nke Jehova nyere Moses n'iwu. 16 Joshua we were ala ahu nile, bú ugwu, na Negeb nile, na ala Goshen nile, na ebe di ala ala, na Araba, na ugwu Israel, na ebe di ala ala ya; 17 site n'ugwu Halak, nke nārigo rue Sia, we rue Beal-gad nime ndagwurugwu Lebanon n'okpuru ugwu Heamon: eze-ha nile ka o were, tib͕ue ha, me ka ha nwua. 18 Ọtutu ubọchi ka Joshua busoro eze ahu nile agha. 19 Ọ dighi obodo nke mere ka ha onwe-ha na umu Israel di n'udo, ma-ọbughi ndi-Haivait ndi bi na Gibeon: ha nile ka ha were n'agha. 20 N'ihi na o sitere n'aka Jehova ime ka obi-ha di ike, izute Israel n'agha, ka O we wezuga ha ka ebibie ha, ka ha we ghara inwe amara, kama ka O we kpochapu ha, dika Jehova nyere Moses iwu. 21 Joshua we bia na mb͕e ahu, bipu ndi Anak ahu n'ugwu, bú nime Hebron, na nime Debia, na n'Anab, na n'ugwu Juda nile, na n'ugwu Israel nile: ha na obodo nile ha ka Joshua wezugara ka ebibie ha. 22 Ọ dighi ndi Anak fọduru n'ala umu Israel; nání nime Geza, na nime Gat, na n'Ashdod, ka ha fọduru. 23 Joshua we were ala ahu nile, dika okwu nile si di nke Jehova gwara Moses; Joshua we nye ya Israel ka ọ buru ihe-nketa, dika esi kè ha n'òkè n'òkè dika ebo nile ha si di. Ala ahu we rapu ibu-agha, di jū.

Joshua 12

1 Ma ndia bu eze ala ahu, ndi umu Israel tib͕uru, nweta ala-ha n'ofè Jọdan n'akuku ọwuwa-anyanwu, site na ndagwurugwu Anon rue ugwu Heamon, na Araba nile n'akuku ọwuwa-anyanwu: 2 Saihon, bú eze ndi-Amorait, onye bi na Heshbon, nāchi kwa site n'Aroea, nke di n'usọ ndagwurugwu Anon, na etiti ndagwurugwu ahu, na nkera Gilead, we rue miri-iyi Jabok, bú ókè-ala umu Amon; 3 na Araba ahu rue oké osimiri Kinerot, n'akuku ọwuwa-anyanwu, ru kwa oké osimiri Araba, bú Oké Osimiri Nnú, n'akuku ọwuwa-anyanwu, n'uzọ ije Bet-jeshimot; na na Ndida, n'okpuru nkpọrube Pisga: 4 na ókè-ala Og, bú eze Beshan, onye sitere na ndi fọduru nke Refaim, onye bi n'Ashtarot na n'Edrei, 5 nāchi kwa n'ugwu Heamon, na nime Saleka, na nime Beshan nile, rue ókè-ala ndi Geshua na ndi Meakat, na nkera Gilead, bú ókè-ala Saihon, bú eze Heshbon. 6 Moses, bú orù Jehova, na umu Israel tib͕uru ha: Moses, bú orù Jehova, we nye ya ndi Reuben, nye kwa ndi Gad, nye kwa nkera ebo Manase, ka ọ buru ihe-nnweta. 7 Ndia bu kwa eze ala ahu ndi Joshua na umu Israel tib͕uru n'ofè Jọdan n'akuku Ọdida-anyanwu, site na Beal-gad nime ndagwurugwu Lebanon we rue ugwu Halak, nke nārigo rue Sia; Joshua we nye ya ebo Israel nile ka ọ buru ihe-nnweta dika esi kè ha n'òkè n'òkè; 8 n'ugwu, na n'ebe di ala ala, na n'Araba ahu, na nime nkpọrube nile, na n'ọzara, na nime Negeb; ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus: 9 eze Jeriko, otù; eze Ai, nke di n'akuku Bet-el, otù; 10 eze Jerusalem, otù; eze Hebron, otù: 11 eze Jamut, otù; eze Lekish, otù; 12 eze Eglon, otù; eze Gezea, otù; 13 eze Debia, otù; eze Geda, otù; 14 eze Họma, otù; eze Arad, otù; 15 eze Libna, otù; eze Adulam, otù; 16 eze Makeda, otù; eze Bet-el, otù; 17 eze Tapua, otù; eze Hefa, otù; 18 eze Efek, otù; eze Lasharon, otù; 19 eze Madon, otù; eze Hezoa, otù; 20 eze Shimron-meron, otù; eze Akshaf, otù; 21 eze Teanak, otù; eze Megido, otù; 22 eze Kedesh, otù; eze Jọkneam nime Kamel, otù; 23 eze Doa n'ebe di elu nke Doa, otù; eze Goim nime Gilgal, otù; 24 eze Tiaza, otù: eze ahu nile di orú na iri na otù.

Joshua 13

1 Ma Joshua ghọrọ agadi, ubọchi ndu-ya nāgwu; Jehova we si ya, I ghọwo agadi, ubọchi ndu-gi nāgwu, ma ala nke riri nne nke-uku fọduru inweta. 2 Nka bu ala nke fọduru: buruburu-ala nile nke ndi Filistia, na ndi Geshua nile; 3 site na Shaihoa ahu, nke di n'iru Ijipt, we rue ókè-ala Ekron n'akuku Ugwu, ndi Kenean ka aguru ya nye: ndi-isi ise nke ndi Filistia; ndi Geza, na ndi Ashdod, na ndi Ashkelon, na ndi Gat, na ndi Ekron; ndi Avim kwa, 4 site na Ndida: ala nile nke ndi Kenean, na Meara nke ndi Zaidon nwe, rue Efek, rue ókè-ala ndi-Amorait: 5 na ala ndi Gebal, na Lebanon nile, n'ọwuwa-anyanwu, site na Beal-gad n'okpuru ugwu Heamon rue nbata Hemat: 6 ndi nile bi n'ugwu site na Lebanon rue Mizrefot-maim, bú ndi Zaidon nile; Mu onwem nānapu ha ala-ha n'iru umu Israel: nání me ka ọ dayere Israel n'ihe-nketa, dika M'nyeworo gi iwu. 7 Ma ub͕u a kère ebo iteghete na nkera ebo Manase ala nka n'ihe-nketa. 8 Ndi Reuben na ndi Gad soro ya nara ihe-nketa-ha, nke Moses nyere ha, n'ofè Jọdan n'akuku ọwuwa-anyanwu, dika Moses, bú orù Jehova, nyere ha; 9 site n'Aroea, nke di n'usọ ndagwurugwu Anon, na obodo nke di n'etiti ndagwurugwu ahu, na ala di lari nile nke Medeba rue Dibon; 10 na obodo nile nke Saihon, bú eze ndi-Amorait, onye buri eze nime Heshbon, rue ókè-ala umu Amon; 11 na Gilead, na ókè-ala ndi Geshua na ndi Meakat, na ugwu Heamon nile, na Beshan nile rue Saleka; 12 ala-eze nile nke Og nime Beshan, onye buri eze n'Ashtarot na n'Edrei (onye ahu fọduru site na ndi fọduru nke Refaim); Moses we tib͕ue ha, napu ha ala-ha. 13 Ma umu Israel anapughi ndi Geshua na ndi Meakat ala-ha: Geshua na Meakat we biri n'etiti umu Israel, rue ta. 14 Nání ebo Livai ka ọ nēnyeghi ihe-nketa; àjà-ọku nile nke Jehova, bú Chineke Israel, nke ahu bu ihe-nketa-ya, dika Ọ gwara ya okwu. 15 Moses we nye ebo umu Reuben dika ab͕uru nile ha si di. 16 Ókè-ala ha nwere we di site n'Aroea, nke di n'usọ ndagwurugwu Anon, na obodo nke di n'etiti ndagwurugwu ahu, na ala di lari nile nke di n'akuku Medeba; 17 Heshbon, na obodo-ya nile nke di n'ala di lari; Dibon, na Bamot-beal, na Bet-beal-meon; 18 na Jehaz, na Kedimot, na Mefaat; 19 na Kiriataim, na Sibma, na Zeret-shaha n'ugwu ndagwurugwu ahu; 20 na Bet-peoa, na nkpọrube nile nke Pisga, na Bet-jeshimot; 21 na obodo nile nke ala di lari, na ala-eze nile nke Saihon, bú eze ndi-Amorait, onye buri eze nime Heshbon, onye Moses tib͕uru, ya na ndi-isi Midian, bú Evi, na Rekem, na Zua, na Hua, na Reba, ndi bu ndi-isi nke Saihon, ndi bi n'ala ahu. 22 Umu Israel were kwa mma-agha b͕ue Belam nwa Beoa, bu onye nāju ase, n'etiti ndi ha b͕uru. 23 Òkè-ala umu Reuben we buru Jọdan, na ókè-ala-ya. Nka bu ihe-nketa umu Reuben dika ab͕uru nile ha si di, obodo nile na obodo ntà nile ha. 24 Moses we nye ebo Gad, bú umu Gad, dika ab͕uru nile ha si di. 25 Ókè-ala-ha we buru Jeza, na obodo nile nke Gilead, na nkera ala umu Amon, rue Aroea nke di n'iru Raba; 26 site kwa na Heshbon rue Remat-mizpe, na Betonim; site kwa na Mahanaim rue ókè-ala Debia; 27 na nime ndagwurugwu ahu, Bet-heram, na Bet-nimra, na Sukot, na Zafon, bú nke fọduru nke ala-eze Saihon, bú eze Heshbon, Jọdan na ókè-ala-ya, rue nsọtu oké osimiri Kineret n'ofè Jọdan n'akuku ọwuwa-anyanwu. 28 Nka bu ihe-nketa umu Gad dika ab͕uru nile ha si di, obodo nile na obodo ntà nile ha. 29 Moses we nye nkera ebo Manase ihe-nketa: ọ we diri nkera ebo umu Manase dika ab͕uru nile ha si di. 30 Ókè-ala-ya we di site na Mahanaim, Beshan nile, ala-eze nile nke Og, bú eze Beshan, na ebe-obibi nile nke Jaia, nke di na Beshan, ọgu obodo atọ: 31 nkera Gilead, na Ashtarot, na Edrei, bú obodo ala-eze Og nime Beshan, we diri umu Makia nwa Manase, diri nkera umu Makia dika ab͕uru nile ha si di. 32 Ndia bu ndi Moses mere ka ha keta ihe n'ala ihe nādighi nke Moab, n'ofè Jọdan n'akuku Jeriko, n'akuku ọwuwa-anyanwu. 33 Ma Moses enyeghi ebo Livai ihe-nketa: Jehova, bú Chineke Israel, bu ihe-nketa-ha, dika Ọ gwara ha okwu.

Joshua 14

1 Ma ndi bu ihe nke umu Israel ketara n'ala Kenean, ndi Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na Joshua nwa Nun, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ebo nile nke umu Israel, mere ka ha keta; 2 n'ifè-nzà ka ihe-nketa-ha di, dika Jehova nyere iwu n'aka Moses, bayere ebo iteghete ahu, baye-kwa-ra nkera ebo ahu. 3 N'ihi na Moses nyere ihe-nketa nke ebo abua na nkera ebo ahu n'ofè Jọdan: ma o nyeghi ndi Livai ihe-nketa n'etiti ha. 4 N'ihi na umu Josef bu ebo abua, bú Manase na Efraim: ha enyeghi kwa ndi Livai òkè n'ala ahu, ma-ọbughi obodo ufọdu ibi obi, ha na ebe-ita-nri-ha nke diri anu-ulo-ha na àkù ha kpatara. 5 Dika Jehova nyere Moses iwu, otú a ka umu Israel mere, ha we kè ala ahu. 6 Umu Juda we biarue nso Joshua nime Gilgal: Keleb nwa Jefune, bú onye-Kenizait, we si ya, Gi onwe-gi amawo okwu Jehova gwara Moses, bú onye nke Chineke, bayerem, baye-kwa-ra gi, nime Kedesh-banea. 7 Ọgu arọ abua ka m'b͕ara mb͕e Moses, bú orù Jehova, si na Kedesh-banea zipum iledo ala nka; m'we weghachiri ya okwu dika o si di n'obim. 8 Ma umu-nnem ndi mu na ha rigoro mereka obi lọ ndi Israel miri: ma mu onwem sozuru Jehova, bú Chinekem, n'azu. 9 Moses we ṅua iyi n'ubọchi ahu, si, Ala nke i zọkwasiri ukwu aghaghi iburu gi na umu-gi ihe-nketa rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi na i sozuwo Jehova, bú Chinekem, n'azu. 10 Ma ub͕u a, le, Jehova emewo ka m'di ndu, dika O kwuru, ọgu arọ abua na ise ndia, site na mb͕e Jehova gwara Moses okwu a, mb͕e Israel jere ije n'ọzara: ma ub͕u a, le, mu onwem b͕ara ọgu arọ anọ na ise ta. 11 Rue ub͕u a m'di ike ta dika m'di n'ubọchi Moses zigaram: dika ikem si di mb͕e ahu, otú a ka ikem di kwa ub͕u a, ibu agha, na ipu apu, na ibata abata. 12 Ma ub͕u a, nyem ugwu a, nke Jehova kwuru okwu bayere ya n'ubọchi ahu; n'ihi na i nuru n'ubọchi ahu na ndi Anak nọ n'ebe ahu, na obodo di uku nke ewusiri ike: eleghi anya Jehova gānọyerem, m'gānapu kwa ha ala-ha, dika Jehova kwuru. 13 Joshua we gọzie ya; ọ we nye Keleb nwa Jefune Hebron ibu ihe-nketa. 14 N'ihi nka Hebron we ghọrọ Keleb nwa Jefune, bú onye-Kenizait, ihe-nketa, rue ta; n'ihi na o sozuru Jehova, bú Chineke Israel, n'azu. 15 Ma aha Hebron na mb͕e gara aga bu Kiriat-aba; onye dikarisiri uku n'etiti ndi Anak ka Aba ahu bu. Ala ahụ we rapu ibu agha, di jū.

Joshua 15

1 Ife-nzà nke mara ebo umu Juda dika ab͕uru nile ha si di we dirue ókè-ala Edom, rue ọzara Zin n'akuku Ndida, na nsọtu Ndida. 2 Ókè-ala Ndida nke ha nwere we di site na nsọtu Oké Osimiri Nnú, site n'ọnu-miri nke nēche iru na Ndida: 3 o we pua rue akuku Ndida nke nrigo Akrabim, gabiga rue Zin, rigo n'akuku Ndida nke Kedesh-banea, gabiga Hezron, rigorue Ada, b͕a buruburu rue Kaka: 4 o we gabiga rue Azmon, pua na miri-iyi Ijipt; ọpupu ókè-ala ahu we di n'oké osimiri: nka gāburu unu ókè-ala Ndida. 5 Ókè-ala ọwuwa-anyanwu we buru Oké Osimiri Nnú, rue nsọtu Jọdan. Ókè-ala akuku Ugwu we site n'ọnu-miri nke oké osimiri ahu na nsọtu Jọdan: 6 ókè-ala ahu we rigo rue Bet-họgla, gabiga n'akuku Ugwu nke Bet-araba; ókè-ala ahu we rigo rue nkume Bohan nwa Reuben: 7 ókè-ala ahu we rigo rue Debia site na ndagwurugwu Ekoa, ga n'akuku Ugwu, nēche Gilgal iru, nke di na ncherita-iru nrigo Adumim, nke di n'akuku Ndida nke miri-iyi ahu: ókè-ala ahu we gabiga rue miri En-shemesh, ọpupu-ya we dirue En-rogel: 8 ókè-ala ahu we rigo na ndagwurugwu nwa Hinom rue akuku ndi Jebus n'akuku Ndida (ndida ahu bu Jerusalem): ókè-ala ahu we rigo rue elu ugwu ahu nke di n'iru ndagwurugwu Hinom n'akuku Ọdida-anyanwu, nke di na nsọtu ndagwurugwu Refaim n'akuku Ugwu: 9 ewe kpa ókè-ala ahu site n'elu ugwu rue isi-iyi miri Neftoa, ọ we pua rue obodo nile nke ugwu Efron; ewe kpa ókè-ala ahu rue Beala (nke ahu bu Kiriat-jearim): 10 ókè-ala ahu we b͕a buruburu site na Beala ga n'akuku Ọdida-anyanwu, rue ugwu Sia, we gabiga rue akuku ugwu Jearim n'Ugwu (nke ahu bu Kesalon), rida rue Bet-shemesh, gabiga Timna: 11 ókè-ala ahu we pua rue akuku Ekron n'akuku Ugwu: ewe kpa ókè-ala ahu rue Shikeron, o we gabiga rue ugwu Beala, we pua na Jabneel; ọpupu ókè-ala ahu di n'oké osimiri. 12 Ókè-ala Ọdida-anyanwu we di rue oké osimiri uku ahu, na ókè-ala-ya. Nka bu ókè-ala umu Juda buruburu, dika ab͕uru nile ha si di. 13 Ọ nye-kwa-ra Keleb Jefune òkè n'etiti umu Juda, dika okwu-ọnu Jehova gwara Joshua si di, bú Kiriat-aba; Aba bu nna Anak (nke ahu bu Hebron). 14 Keleb we si n'ebe ahu napu umu-ndikom Anak atọ, bú Sheshai, na Ahiman, na Talmai, umu Anak, ala-ha. 15 Ọ we si n'ebe ahu rigo imegide ndi bi na Debia: ma aha Debia na mb͕e gara aga bu Kiriat-sefa. 16 Keleb we si, Onye ahu nke gētib͕u Kiriat-sefa, were ya, m'gēnye kwa ya Aksa, bú nwam nwayi, na nwunye. 17 Ọtniel nwa Kenaz, nwa-nne Keleb, we were ya: o we nye ya Aksa, bú nwa-ya nwayi, na nwunye. 18 O rue, mb͕e Aksa biara, na ọ kpaliri di-ya iriọ ubi n'aka nna-ya: Aksa si n'inyinya-ibu-ya rida; Keleb we si ya, Gini ka i nāchọ? 19 Ọ si, Nyem ngọzi; n'ihi na ọ bu ala Negeb ka i nyeworom, nyekwam isi miri ufọdu. Ọ we nye ya isi miri di n'elu, na isi miri di n'okpuru. 20 Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Juda dika ab͕uru nile ha si di. 21 Obodo nke di na nsọtu ebo umu Juda nwere n'akuku ókè-ala Edom nime Negeb bu Kabzeel, na Ida, na Jagua; 22 na Kina, na Dimona, na Adada; 23 na Kedesh, na Hezoa, na Itnan; 24 na Zif, na Telem, na Bealot; 25 na Hezoa-hadata, na Keriot-hezron (nke ahu bu Hezoa); 26 na Amam, na Shema, na Molada; 27 na Haza-gada, na Heshmon, na Bet-pelet; 28 na Haza-shual, na Bia-sheba, na Biziotia; 29 na Beala, na Iyim, na Ezem; 30 na Eltolad, na Kesil, na Họma; 31 na Ziklag, na Madmana, na Sansana; 32 na Lebaot, na Shilhim, na Ain, na Rimon: obodo nile di orú na iteghete, ha na obodo ntà ha. 33 N'ebe di ala ala, Eshtaol, na Zọra, na Ashna; 34 na Zanoa, na En-ganim, na Tapua, na Inam; 35 na Jamut, na Adulam, na Soko, na Azeba; 36 na Shaaraim, na Aditaim, na Gedira, na Gedirotaim; obodo iri na anọ na obodo ntà ha. 37 Zenan, na Hadasha, na Migdal-gad; 38 na Dilan, na Mizpe, na Jọkteel; 39 na Lekish, na Bọzkat, na Eglon; 40 na Kabon, na Lahmam, na Kitlish; 41 na Gedirot, na Bet-degon, na Neama, na Makeda; obodo iri na isi na obodo ntà ha. 42 Libna, na Eta, na Ashan; 43 na Ifta, na Ashna, na Nezib; 44 na Keila, na Akzib, na Marisha; obodo iteghete na obodo ntà ha. 45 Ekron, na umu-obodo-ya na obodo ntà ya nile: 46 site n'Ekron we rue oké osimiri, obodo nile nke di n'akuku Ashdod, na obodo ntà ha. 47 Ashdod, na umu-obodo-ya na obodo ntà ya nile; Geza, na umu-obodo-ya na obodo ntà ya nile; rue miri-iyi Ijipt, na oké osimiri uku ahu, na ókè-ala-ya. 48 N'ugwu kwa, Shamia, na Jatia, na Soko; 49 na Dana, na Kiriat-sana (nke ahu bu Debia); 50 na Anab, na Eshtemo, na Anim; 51 na Goshen, na Holon, na Gailo; obodo iri na otù na obodo ntà ha. 52 Arab, na Duma, na Eshan; 53 na Janim, na Bet-tapua, na Afika; 54 na Humta, na Kiriat-aba (nke ahu bu Hebron), na Zioa; obodo iteghete na obodo ntà ha. 55 Maon, na Kamel, na Zif, na Juta; 56 na Jesreel; na Jokdeam, na Zanoa; 57 na Kain, na Gibea, na Timna; obodo iri na obodo ntà ha. 58 Halhul, na Bet-zua, na Gedoa; 59 na Maarat, na Bet-anot, na Eltekon; obodo isi na obdo ntà ha. 60 Kiriat-beal (nke ahu bu Kiriat-jearim), na Raba; obodo abua na obodo ntà ha. 61 N'ọzara, Bet-araba, na Midin, na Sekaka; 62 na Nibshan, na Obodo Nnú, na En-gedi; obodo isi na obodo ntà ha. 63 Ma ndi Jebus, ndi bi na Jerusalem, umu Juda apughi inapu ha ala-ha: ndi Jebus we biri n'etiti umu Juda nime Jerusalem, rue ta.

Joshua 16

1 Ife-nzà nke mara umu Josef siri na Jọdan pua Jeriko, na miri Jeriko n'ọwuwa-anyanwu, bú ọzara ahu, nēsi na Jeriko rigo n'ugwu rue Bet-el; 2 o si na Bet-el pua rue Luz, gabiga rue ókè-ala ndi-Akait rue Atarot; 3 ọ rida n'akuku Ọdida-anyanwu rue ókè-ala ndi-Jafletait, rue ókè-ala Bet-horon di n'okpuru, rue Gezea: ọpupu-ya we di n'oké osimiri. 4 Umu Josef, bú Manase na Efraim, we keta nke ha. 5 Ókè-ala umu Efraim, dika ab͕uru nile ha si di, we di otú a: ókè-ala nke ihe-nketa-ha n'akuku ọwuwa-anyanwu bu Atarot-ada, rue Bet-horon di n'elu; 6 ókè-ala ahu we pua n'akuku Ọdida-anyanwu na Mikmetat n'Ugwu; ókè-ala ahu we b͕a buruburu n'akuku ọwuwa-anyanwu, rue Taanat-shailo, we gabiga ya n'akuku ọwuwa-anyanwu Janoa; 7 o si na Janoa rida rue Atarot, ru kwa Naarah, metu Jeriko, we pua na Jọdan. 8 Ókè-ala ahu siri na Tapua je n'akuku Ọdida-anyanwu rue miri-iyi Kena; ọpupu-ya we di n'oké osimiri. Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Efraim dika ab͕uru nile ha si di; 9 tiyere obodo nile akpaputara umu Efraim n'etiti ihe-nketa nke umu Manase, obodo ahu nile na obodo ntà nile ha. 10 Ma ha anapughi ndi Kenean ndi bi na Gezea ala-ha: ndi Kenean we biri n'etiti Efraim, rue ta, ghọ ndi nēfè òfùfè orù.

Joshua 17

1 Ife-nzà nke mara ebo Manase di kwa: n'ihi na ya onwe-ya bu ọkpara Josef. Ọ diri Makia ọkpara Manase, bú nna Gilead, n'ihi na onye ahu bu onye-agha, o we nwe Gilead na Beshan. 2 Ife-nzà di kwa nke mara umu Manase fọduru dika ab͕uru nile ha si di; ọ diri umu Abieza, di-kwa-ra umu Hilek, di-kwa-ra umu Asriel, di-kwa-ra umu Shekem, di-kwa-ra umu Hifa, di-kwa-ra umu Shemida: ndia bu umu-ndikom Manase nwa Josef dika ab͕uru nile ha si di. 3 Ma Zelọfehad, nwa Hifa, nwa Gilead, nwa Makia, nwa Manase, enweghi umu-ndikom, ma ọ nwere umu-ndinyom: ndia bu kwa aha umu-ya ndinyom, Mahla, na Noa, na Họgla, na Milka, na Tiaza. 4 Ha we biarue nso n'iru Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na n'iru Joshua nwa Nun, na n'iru ndi-isi, si, Jehova nyere Moses iwu inye ayi ihe-nketa n'etiti umu-nne-ayi: o we nye ha ihe-nketa n'etiti umu-nne nna-ha dika okwu-ọnu Jehova si di. 5 Òkè iri we dabara Manase, nāgughi ala Gilead na Beshan, nke di n'ofè Jọdan; 6 n'ihi na umu-ndinyom Manase ketara ihe-nketa n'etiti umu-ya ndikom: ala Gilead kwa, umu-ndikom Manase fọduru nwere ya. 7 Ókè-ala Manase we si n'Asha rue Mikmetat, nke di n'iru Shekem; ókè-ala ahu we je rue aka-nri, rue ndi bi n'En-tapua. 8 Manase nwe ala Tapua: ma umu Efraim nwe Tapua rue ókè-ala Manase. 9 Ókè-ala ahu we rida rue miri-iyi Kena, n'akuku Ndida nke miri-iyi ahu: obodo ndia ka Efraim nwere n'etiti obodo Manase: ókè-ala Manase we di n'akuku Ugwu miri-iyi ahu, ọpupu-ya we di n'oké osimiri: 10 n'akuku Ndida ọ diri Efraim, ma n'akuku Ugwu ọ diri Manase, oké osimiri bu kwa ókè-ala-ya; ha we metu Asha n'Ugwu, metu kwa Isaka n'ọwuwa-anyanwu. 11 Manase nwekwara obodo n'Isaka na n'Asha, bú Bet-shean na umu-obodo-ya, na Ibleam na umu-obodo-ya, na ndi bi na Doa na umu-obodo-ya, na ndi bi na En-doa na umu-obodo-ya, na ndi bi na Teanak na umu-obodo-ya, na ndi bi na Megido na umu-obodo-ya, bú ebe di elu atọ ahu. 12 Ma umu Manase apughi inapu ndi bi n'obodo ahu ala-ha; ma ndi Kenean jisiri ike ibiri n'ala ahu. 13 O rue, mb͕e umu Israel di ike, na ha tiyere ndi Kenean n'ifè-òfùfè, ma ha anapusighi ha ala-ha. 14 Umu Josef we gwa Joshua okwu, si, Gini mere i nyeworom otù ihe-ife-nzà na otù òkè n'ihe-nketa; ma mu onwem bu ndi bara uba, n'ihi na Jehova agọziwom rue ub͕u a? 15 Joshua we si ha, Ọ buru ndi bara uba ka i bu, rigorue oké ọhia n'onwe-gi, b͕utu-kwa-ra onwe-gi n'ebe ahu n'ala ndi-Perizait na Refaim; ebe ugwu Efraim diri gi nkpa. 16 Umu Josef we si, Ugwu a ezughi ayi: ma ub͕ọ-ala ígwè di n'aka ndi Kenean nile ndi bi n'ala ndagwurugwu, ma ndi bi na Bet-shean na umu-obodo-ya, ma ndi bi na Jezreel. 17 Joshua we gwa ulo Josef, bú Efraim na Manase, okwu, si, Ndi bara uba ka i bu, ọ bu kwa ike uku ka i nwere: i gaghi-enwe nání otù ihe-ife-nzà: 18 n'ihi na ugwu ahu ka i gēnwe; n'ihi na oké ọhia ka ọ bu, i gēb͕utu kwa ya, i gēnwe kwa ọpupu-ya nile: n'ihi na i gānapu ndi Kenean ala-ha, ọ bu ezie na ha nwere ub͕ọ-ala ígwè, ọ bu kwa ezie na ndi di ike ka ha bu.

Joshua 18

1 Nzukọ nile nke umu Israel we kpọkọta onwe-ha na Shailo, ma ulo-ikwū nzute n'ebe ahu: ewe buda ala ahu n'iru ha. 2 Ebo asa we fọdu n'etiti umu Israel, ndi anēkeghi ihe-nketa-ha. 3 Joshua we si umu Israel, Rùe ole mb͕e ka unu onwe-unu gābu ndi-ume-ngwu ibà inweta ala ahu, nke Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, nyeworo unu? 4 Doronu onwe-unu ndikom atọ inọrọ ebo ọ bula: m'gēziga kwa ha, ha gēbili kwa, jegharia n'ala nka, de ya n'akwukwọ dika ihe-nketa-ha si di; ha gābiakutekwam. 5 Ha gēkè kwa ya òkè asa: Juda gēguzo n'ókè-ala-ya na Ndida, ulo Josef gēguzo kwa n'ókè-ala-ha n'Ugwu. 6 Unu onwe-unu gēde kwa ala ahu n'akwukwọ n'òkè asa, wetaram akwukwọ ahu n'ebe a: m'gēfe-kwa-ra unu nzà n'ebe a n'iru Jehova, bú Chineke-ayi. 7 N'ihi na ndi Livai enweghi òkè n'etiti unu; n'ihi na ọlu-nchu-àjà Jehova bu ihe-nketa-ha: Gad na Reuben na nkera ebo Manase anarawo kwa ihe-nketa-ha n'ofè Jọdan n'akuku ọwuwa-anyanwu, nke Moses, bú orù Jehova nyere ha. 8 Ndikom ahu we bilie, je: Joshua we nye ndi nēje ide ala ahu n'akwukwọ iwu, si, Jenu, jegharia n'ala nka, de ya n'akwukwọ, laghachikutem, m'gēfe-kwa-ra unu nzà n'ebe a n'iru Jehova, nime Shailo. 9 Ndikom ahu we je, gabiga n'ala ahu, de ya n'akwukwọ dika obodo nile si di n'òkè asa, ha we biakute Joshua rue ọmuma-ulo-ikwū nime Shailo. 10 Joshua we fere ha nzà nime Shailo n'iru Jehova: Joshua we kère umu Israel ala n'ebe ahu dika esi kè ha n'òkè n'òkè. 11 Ife-nzà nke ebo umu Benjamin we puta dika ab͕uru nile ha si di; ókè-ala nke ihe-ife-nzà-ha we puta n'etiti umu Juda na umu Josef. 12 Ókè-ala ha nwere n'akuku Ugwu we site na Jọdan; ókè-ala ahu we rigo rue akuku Jeriko n'Ugwu, rigo kwa n'ugwu n'akuku Ọdida-anyanwu; ọpupu-ya di kwa n'ọzara Bet-even. 13 Ókè-ala ahu we si n'ebe ahu gabiga rue Luz, rue akuku Luz (nke ahu bu Bet-el), n'akuku Ndida; ókè-ala ahu we rida rue Atarot-ada, n'elu ugwu nke di na Ndida nke Bet-horon di n'okpuru. 14 Ewe kpa ókè ahu, o we b͕a buruburu rue akuku Ọdida-anyanwu n'akuku Ndida, site n'ugwu nke di n'iru Bet-horon n'akuku Ndida; ọpupu-ya di kwa na Kiriat-beal (nke ahu bu Kiriat-jearim), bú obodo umu Juda: nka bu akuku Ọdida-anyanwu. 15 Akuku Ndida we site na nsọtu Kiriat-jearim, ókè-ala ahu we pua n'akuku Ọdida-anyanwu, pua rue isi-iyi miri Neftoa: 16 ókè-ala ahu we rida rue nsọtu ugwu ahu nke di n'iru ndagwurugwu nwa Hinom, nke di na ndagwurugwu Refaim n'akuku Ugwu; ọ rida rue ndagwurugwu Hinom, rue akuku ndi Jebus n'akuku Ndida, we rida rue En-rogel; 17 ewe kpa ókè-ala ahu n'Ugwu, ọ pua n'En-shemesh, pu kwa rue Gelilot, nke di na ncherita-iru nrigo Adumim; ọ rida rue nkume Bohan nwa Reuben; 18 ọ gabiga rue akuku na ncherita-iru Araba n'akuku Ugwu, we rida rue Araba: 19 ókè-ala ahu we gabiga rue akuku Bet-họgla n'akuku Ugwu: ọpupu ókè-ala ahu di kwa n'ọnu-miri Ugwu nke Oké Osimiri Nnú, na nsọtu Ndida nke Jọdan; nka bu ókè-ala Ndida. 20 Jọdan bu kwa ókè-ala-ya n'akuku Iru-anyanwu. Nka bu ihe-nketa umu Benjamin, dika ókè-ala-ya nile si di buruburu dika ab͕uru nile ha si di. 21 Ma obodo ebo umu Benjamin nwere dika ab͕uru nile ha si di bu Jeriko, na Bet-họgla, na Emek-keziz; 22 na Bet-araba, na Zemaraim, na Bet-el; 23 na Avim, na Para, na Ọfra; 24 na Kefa-amoni, na Ọfni, na Geba; obodo iri na abua na obodo ntà ha: 25 na Gibeon, na Rema, na Beirot; 26 na Mizpeh, na Kefira, na Moza; 27 na Rekem, na Iapeel, na Tarala; 28 na Zela, na Elef, na ndi Jebus (nke ahu bu Jerusalem), na Gibeat, na Kiriat; obodo iri na anọ na obodo ntà ha. Nka bu ihe-nketa umu Benjamin dika ab͕uru nile ha si di.

Joshua 19

1 Ife-nzà nke-abua we putara Simeon, bú ebo umu Simeon dika ab͕uru nile ha si di: ihe-nketa-ha di n'etiti ihe-nketa umu Juda. 2 Ha we nwe n'ihe-nketa-ha Bia-sheba, ma-ọbu Sheba, na Molada; 3 na Haza-shual, na Bala, na Ezem; 4 na Eltolad, na Betul, na Họma; 5 na Ziklag, na Bet-makabot, na Haza-susa; 6 na Bet-lebaot, na Sharuhen; obodo iri na atọ na obodo ntà ha: 7 na Ain, na Rimon, na Eta, na Ashan; obodo anọ na obodo ntà ha: 8 na obodo ntà nile nke di obodo ndia buruburu rue Bealat-bia, bú Rema nke Negeb. Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Simeon dika ab͕uru nile ha si di. 9 Site n'òkè umu Juda ka ihe-nketa umu Simeon di: n'ihi na òkè umu Juda riri nne kari ha: umu Simeon we keta ihe n'etiti ihe-nketa-ha. 10 Ife-nzà nke-atọ we putara umu Zebulun dika ab͕uru nile ha si di: ókè-ala ihe-nketa-ha we di rue Sarid: 11 ókè-ala-ha we rigo n'akuku Ọdida-anyanwu, ru kwa Marala, we metu Dabeshet, metu kwa miri-iyi nke di n'iru Jọkneam; 12 o si na Sarid chigharia n'akuku Iru-anyanwu n'ọwuwa-anyanwu rue ókè-ala Kislot-teboa; ọ pua rue Daberat, we rigo rue Jafia; 13 o si n'ebe ahu gabiga n'akuku Iru-anyanwu n'akuku ọwuwa-anyanwu rue Gat-hefa, rue Et-kazin; ọ pua na Rimon, nke akpara rue Nea; 14 ókè-ala ahu we b͕a ya buruburu n'Ugwu rue Hanaton: ọpupu-ya di kwa na ndagwurugwu Ifta-el; 15 na Katat, na Nahalal, na Shimron, na Idala, na Bet-lehem: obodo iri na abua na obodo ntà ha. 16 Nka bu ihe-nketa umu Zebulun dika ab͕uru nile ha si di, obodo ndia na obodo ntà ha. 17 Ife-nzà nke-anọ we putara Isaka, bú umu Isaka dika ab͕uru nile ha si di. 18 Ókè-ala-ha we rue Jezreel, na Kesulot, na Shunem; 19 na Hafaraim, na Shion, na Anaharat; 20 na Rabit, na Kishion, na Ebez; 21 na Remet, na En-ganim, na En-hada, na Bet-pazez: 22 ókè-ala ahu we metu Teboa, na Shahazuma, na Bet-shemesh; ọpupu ókè-ala-ha di kwa na Jọdan: obodo iri na isi na obodo ntà ha. 23 Nka bu ihe-nketa ebo umu Isaka dika ab͕uru nile ha si di, obodo ahu na obodo ntà ha. 24 Ife-nzà nke-ise we putara ebo umu Asha dika ab͕uru nile ha si di. 25 Ókè-ala-ha we buru Helkat, na Hali, na Beten, na Akshaf; 26 na Alamelek, na Amad, na Mishal; ọ metu Kamel n'akuku Ọdida-anyanwu, metu kwa Shaihoa-libnat; 27 ọ we chigharia n'ọwuwa-anyanwu rue Bet-degon, we metu Zebulun, metu kwa ndagwurugwu Ifta-el n'akuku Ugwu rue Bet-emek na Neiel; ọ pua rue Kabul n'aka-ekpe, 28 na Ebron, na Rehob, na Hamon, na Kena, we rue Zaidon bara uba; 29 ókè-ala ahu we chigharia rue Rema, ru kwa obodo ahu ewusiri ike, bú Taia; ókè-ala ahu we chigharia rue Hosa; ọpupu-ya di kwa n'oké osimiri site na Hebel rue Akzib: 30 na Uma, na Efek, na Rehob: orú obodo na abua na obodo ntà ha. 31 Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Asha dika ab͕uru nile ha si di, obodo ndia na obodo ntà ha. 32 Ọ bu umu Naftali ka ife-nzà nke-isi putara, bú umu Naftali dika ab͕uru nile ha si di. 33 Ókè-ala-ha we site na Helef, site n'osisi terebinth nime Zaananim, na Adami-nekeb, na Jabneel, rue Lakum; ọpupu-ya we di na Jọdan: 34 ókè-ala ahu we chigharia n'akuku Ọdida-anyanwu rue Aznot-teboa, si n'ebe ahu pua rue Hukok; ọ metu Zebulun na Ndida, metu kwa Asha n'Ọdida-anyanwu, metu kwa Juda n'akuku Jọdan n'ọwuwa-anyanwu. 35 Obodo ewusiri ike bu Zidim, na Zea, na Hamat, na Rakat, na Kineret; 36 na Adama, na Rema, na Hezoa; 37 na Kedesh, na Edrei, na En-hezoa; 38 na Iron, na Migdal-el, na Horem, na Bet-anat, na Bet-shemesh; obodo iri na iteghete na obodo ntà ha. 39 Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Naftali dika ab͕uru nile ha si di, obodo nile na obodo ntà ha. 40 Ọ bu ebo umu Dan dika ab͕uru nile ha si di ka ife-nzà nke-asa putara. 41 Ókè-ala ihe-nketa-ha we buru Zọra, na Eshtaol, na Ia-shemesh; 42 na Shaalabin na Ajalon, na Itla; 43 na Ilon, na Timna, na Ekron; 44 na Elteke, na Gibeton, na Bealat; 45 na Jihud, na Bene-berak, na Gat-rimon; 46 na Me-jakon, na Rakon, tiyere ókè-ala di na ncherita-iru Jafo. 47 Ókè-ala umu Dan we si n'ebe ha nọ pua: umu Dan we rigo, buso Leshem agha, were ya, were ọnu mma-agha tib͕ue ya, ha we nweta ya, biri nime ya, we kpọ Leshem, Dan, dika aha Dan, bú nna-ha, si di. 48 Nka bu ihe-nketa ebo umu Dan dika ab͕uru nile ha si di, obodo ndia na obodo ntà ha. 49 Ha we mesia ka eketa ala ahu dika ókè-ala-ya nile si di; umu Israel we nye Joshua nwa Nun ihe-nketa n'etiti ha: 50 n'okwu-ọnu Jehova ka ha nyere ya obodo ahu nke ọ riọrọ, bú Timnat-sera n'ugwu Efraim: o wue obodo ahu, biri nime ya. 51 Ndia bu ihe-nketa, nke Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na Joshua nwa Nun, na ndi-isi ulo ndi bu nna ebo umu Israel, mere ka eketa n'ife-nzà nime Shailo n'iru Jehova, n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute. Ha we kebìe ala ahu.

Joshua 20

1 Jehova we gwa Joshua okwu, si, 2 Gwa umu Israel okwu, si, Wezugara onwe-unu obodo nb͕abà ahu, nke M'gwara unu okwu bayere ha n'aka Moses: 3 ka ob͕u-madu onye nētib͕u madu n'ọghọm nāmaghi ama we b͕alaga n'ebe ahu: ha gābu-kwa-ra unu ebe-nb͕abà ipu n'aka onye-ọ́bọ̀ ọbara. 4 Ọ gāb͕alaga kwa n'otù nime obodo ahu, guzo n'oghere ọnu-uzọ-ama obodo ahu, kwue okwu-ya nile na nti ndi-okenye obodo ahu; ha gākpọbata kwa ya n'obodo tiyere onwe-ha, nye ya ọnọdu, ka o we biri n'etiti ha. 5 Ma mb͕e onye-ọ́bọ̀ ọbara gāchu ya n'azu, ha agaghi ekwe ka ob͕u-madu ahu ba n'aka-ya; n'ihi na ọ bu n'amaghi-ama ka o tib͕uru madu-ibe-ya, ma ọ kpọghi ya asì na mb͕e gara aga. 6 O gēbi kwa n'obodo ahu, rue mb͕e o gēguzo n'iru nzukọ Israel ka ekpe ya ikpe, rue ọnwu onye-isi-nchu-àjà nke gānọ na mb͕e ahu: mb͕e ahu ob͕u-madu ahu gālaghachi, ba n'obodo-ya, ba kwa n'ulo-ya, rue obodo ahu nke o si n'ebe ahu b͕alaga. 7 Ha we do obodo ndia nsọ, bú Kedesh nime Galili, n'ugwu Naftali, na Shekem n'ugwu Efraim, na Kiriat-aba (nke ahu bu Hebron) n'ugwu Juda. 8 N'ofè Jọdan n'akuku Jeriko n'akuku ọwuwa-anyanwu ha nye-kwa-ra Beza n'ọzara n'ala di lari site n'ebo Reuben, na Remot nime Gilead site n'ebo Gad, na Golan nime Beshan site n'ebo Manase. 9 Ndia bu obodo akara àkà bayere umu Israel nile, baye-kwa-ra ọbìa nke nānọ dika ọbìa n'etiti ha, ka onye ọ bula nke nētib͕u madu n'ọghọm we b͕alaga n'ebe ahu, ghara kwa onwu n'aka onye-ọ́bọ̀ ọbara, rue mb͕e ọ gēguzo n'iru nzukọ Israel.

Joshua 21

1 Ndi-isi ulo nke ndi bu nna ndi Livai we biarue nso Eleeza, bú onye-nchu-àjà, biaru kwa nso Joshua nwa Nun, biaru kwa nso ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ebo nile nke umu Israel; 2 ha we gwa ha okwu nime Shailo n'ala Kenean, si, Jehova nyere iwu n'aka Moses inye ayi obodo ufọdu ayi gēbi, ha na ebe-ita-nri-ha nke gādiri anu-ulo-ayi. 3 Umu Israel we si n'ihe-nketa-ha nye ndi Livai, dika okwu-ọnu Jehova si di, obodo ndia na ebe-ita-nri-ha. 4 Ife-nzà we putara ab͕uru nile nke ndi Kohat: umu Eron, bú onye-nchu-àjà, ndi sitere na ndi Livai, we nwe obodo iri na atọ sitere n'ebo Juda, site kwa n'ebo ndi Simeon, site kwa n'ebo Benjamin, n'ife-nzà. 5 Umu Kohat fọduru we nwe obodo iri sitere n'ab͕uru nile nke ebo Efraim, site kwa n'ebo Dan, site kwa na nkera ebo Manase, n'ife-nzà. 6 Umu Giashon we nwe obodo iri na atọ sitere n'ab͕uru nile nke ebo Isaka, site kwa n'ebo Asha, site kwa n'ebo Naftali, site kwa na nkera ebo Manase nime Beshan, n'ife-nzà. 7 Umu Merari dika ab͕uru nile ha si di we nwe obodo iri na abua sitere n'ebo Reuben, site kwa n'ebo Gad, site kwa n'ebo Zebulun. 8 Umu Israel we nye ndi Livai obodo ndia na ebe-ita-nri-ha n'ife-nzà, dika Jehova nyere iwu n'aka Moses. 9 Ha we si n'ebo umu Juda, si kwa n'ebo umu Simeon, nye obodo ndia nke akpọrọ ha n'aha n'ebe a: 10 ha we diri umu Eron, ndi sitere n'ab͕uru ndi Kohat, ndi sitere n'umu Livai: n'ihi na ha ka ife-nzà mbu diri. 11 Ha we nye ha Kiriat-aba, nna Anak ka Aba ahu bu, (nke ahu bu Hebron, ) n'ugwu Juda, ya na ebe-ita-nri-ya nile buruburu ya. 12 Ma ọhia nke obodo ahu, na obodo ntà ya nile, ka ha nyere Keleb nwa Jefune n'ihe-onwunwe-ya. 13 Umu Eron, bú onye-nchu-àjà, ka ha nyere Hebron na ebe-ita-nri-ya, bú obodo nb͕abà nke ob͕u-madu, na Libna na ebe-ita-nri-ya nile; 14 na Jatia na ebe-ita-nri-ya nile, na Eshtemoa na ebe-ita-nri-ya nile, 15 na Holon na ebe-ita-nri-ya nile, na Debia na ebe-ita-nri-ya nile; 16 na Ain na ebe-ita-nri-ya nile, na Juta na ebe-ita-nri-ya nile, na Bet-shemesh na ebe-ita-nri-ya nile; obodo iteghete site n'ebo abua ahu. 17 Site kwa n'ebo Benjamin, Gibeon na ebe-ita-nri-ya nile, na Geba na ebe-ita-nri-ya nile; 18 na Anatot na ebe-ita-nri-ya nile, na Almon na ebe-ita-nri-ya nile: obodo anọ. 19 Obodo nile nke umu Eron, bú ndi-nchu-àjà, di obodo iri na atọ na ebe-ita-nri-ha. 20 Ab͕uru nile nke umu Kohat, bú ndi Livai, bú ndi fọduru site n'umu Kohat, ha nwere obodo ife-nzà-ha site n'ebo Efraim. 21 Ha we nye ha Shekem na ebe-ita-nri-ya nile n'ugwu Efraim, bú obodo nb͕abà nke ob͕u-madu, na Gezea na ebe-ita-nri-ya nile; 22 na Kibzaim na ebe-ita-nri-ya nile, na Bet-horon na ebe-ita-nri-ya nile; obodo anọ. 23 Site kwa n'ebo Dan, Elteke na ebe-ita-nri-ya nile, na Gibeton na ebe-ita-nri-ya nile; 24 na Ajalon na ebe-ita-nri-ya nile, na Gat-rimon na ebe-ita-nri-ya nile; obodo anọ. 25 Site kwa na nkera ebo Manase, Tanak na ebe-ita-nri-ya nile, na Gat-rimon na ebe-ita-nri-ya nile; obodo abua. 26 Obodo nile di iri, ha na ebe-ita-nri-ha, bú nke diri ab͕uru umu Kohat fọduru. 27 Ha nye-kwa-ra umu Giashon, ndi sitere n'ab͕uru ndi Livai, Golan nime Beshan na ebe-ita-nri-ya nile, bú obodo nb͕abà nke ob͕u-madu; na Be-eshtera na ebe-ita-nri-ya nile, site na nkera ebo Manase; obodo abua. 28 Site kwa n'ebo Isaka, Kishion na ebe-ita-nri-ya nile, na Daberat na ebe-ita-nri-ya nile; 29 na Jamut na ebe-ita-nri-ya nile, na En-ganim na ebe-ita-nri-ya nile, obodo anọ. 30 Site kwa n'ebo Asha, Mishal na ebe-ita-nri-ya nile, na Abdon na ebe-ita-nri-ya nile; 31 na Helkat na ebe-ita-nri-ya nile, na Rehob na ebe-ita-nri-ya nile; obodo anọ. 32 Site kwa n'ebo Naftali, Kedesh nime Galili na ebe-ita-nri-ya nile, bú obodo nb͕abà nke ob͕u-madu, na Hamot-doa na ebe-ita-nri-ya nile, na Katan na ebe-ita-nri-ya nile; obodo atọ. 33 Obodo nile nke ndi Giashon, dika ab͕uru nile ha si di, di obodo iri na atọ na ebe-ita-nri-ha. 34 Ha nye-kwa-ra ab͕uru nile nke umu Merari, bú Livai fọduru, Jokneam na ebe-ita-nri-ya nile; na Kata na ebe-ita-nri ya nile, 35 na Dimna na ebe-ita-nri-ya nile, na Nahalal na ebe-ita-nri-ya nile, sitere n'ebo Zebulun; obodo anọ. 36 Site kwa n'ebo Reuben, Beza na ebe-ita-nri-ya nile, na Jehaz na ebe-ita-nri-ya nile, 37 na Kedimot na ebe-ita-nri-ya nile, na Mefaat na ebe-ita-nri-ya nile; obodo anọ. 38 Site n'ebo Gad, Remot nime Gilead na ebe-ita-nri-ya nile, bú obodo nb͕abà nke ob͕u-madu, na Mahanaim na ebe-ita-nri-ya nile; 39 na Heshbon na ebe-ita-nri-ya nile, na Jeza na ebe-ita-nri-ya nile; obodo ahu nile di anọ. 40 Obodo ahu nile diri umu Merari dika ab͕uru nile ha si di, bú ndi fọduru site n'ab͕uru nile nke ndi Livai; ihe-ife-nzà-ha we di obodo iri na abua. 41 Obodo nile nke ndi Livai n'etiti ihe-onwunwe umu Israel di ọgu obodo abua na asatọ na ebe-ita-nri-ha. 42 Obodo ndia di otú a, obodo ọ bula na ebe-ita-nri-ya nile buruburu ya: otú a ka ọ diri obodo ndia nile. 43 Jehova we nye Israel ala ahu nile nke Ọ ṅuru iyi inye ndi bu nna-ha; ha we nweta ya, we biri nime ya. 44 Jehova we me ka ha zuru ike buruburu, dika ihe nile si di nke Ọ ṅuru ndi bu nna-ha iyi: ọ dighi kwa nwoke ọ bula n'etiti ndi-iro-ha nile guzoro n'iru ha; ndi-iro-ha nile ka Jehova nyere n'aka-ha. 45 Ọ dighi ihe ọ bula dapuru n'ezi ihe nile nke Jehova gwara ulo Israel; ha nile mere.

Joshua 22

1 Mb͕e ahu Joshua kpọrọ ndi Reuben, kpọ kwa ndi Gad, kpọ kwa nkera ebo Manase, 2 si ha, Unu onwe-unu edebewo ihe nile nke Moses, bú orù Jehova, nyere unu n'iwu, unu egewo kwa nti olum n'ihe nile m'nyere unu n'iwu: 3 unu arapughi umu-nne-unu ọtutu ubọchi ndia rue ta, ma unu edebewo ihe-ndebe nke ihe Jehova, bú Chineke-unu, nyere n'iwu. 4 Ma ub͕u a Jehova, bú Chineke-unu, emewo ka umu-nne-unu zuru ike, dika Ọ gwara ha okwu: ub͕u a kwa chigharianu, jerue ulo-ikwū-unu n'onwe-unu, rue ala ihe-onwunwe-unu, nke Moses, bú orù Jehova, nyere unu n'ofè Jọdan. 5 Nání, lezienu anya nke-ọma ime ihe enyere n'iwu na iwu ahu, nke Moses, bú orù Jehova, nyere unu n'iwu, ihu Jehova, bú Chineke-unu, n'anya, na ije íjè n'uzọ-Ya nile, na idebe ihe nile O nyere n'iwu, na irapara n'aru Ya, na iwere obi-unu nile na nkpuru-obi-unu nile fè Ya òfùfè. 6 Joshua we gọzie ha, zilaga ha: ha we jerue ulo-ikwū-ha. 7 Ma nkera ebo Manase ka Moses nyere ihe-nketa nime Beshan: ma Joshua nyere nkera-ya ọzọ ihe-nketa n'etiti umu-nne-ha n'ofè Jọdan n'akuku Ọdida-anyanwu. Ọzọ kwa, mb͕e Joshua zilagara ha n'ulo-ikwū-ha, ọ gọzie ha, 8 gwa ha okwu, si, Werenu ọtutu àkù laghachi n'ulo-ikwū-unu, were kwa anu-ulo bara uba nke-uku, were kwa ọla-ọcha, were kwa ọla-edo, were kwa ọla, were ígwè, were kwa uwe bara uba nke-uku: soronu umu-nne-unu kere ihe-nkwata ndi-iro-unu. 9 Umu Reuben na umu Gad na nkera ebo Manase we laghachi, si n'ebe umu Israel nọ site na Shailo, nke di n'ala Kenean, ga, ijeru ala Gilead, iru ala ihe-onwunwe-ha, nke ha nwere ihe-onwunwe nime ya, dika okwu-ọnu Jehova n'aka Moses si di. 10 Ha we biarue buruburu-ala Jọdan, nke di n'ala Kenean, umu Reuben na umu Gad na nkera ebo Manase we wue ebe-ichu-àjà n'ebe ahu n'akuku Jọdan, bú ebe-ichu-àjà uku n'ile ya anya. 11 Umu Israel we nu, si, Le, umu Reuben na umu Gad na nkera ebo Manase ewuwo ebe-ichu-àjà na ncherita-iru ala Kenean, nime buruburu-ala Jọdan, n'ofè umu Israel nwe. 12 Mb͕e umu Israel nuru ya, nzukọ nile nke umu Israel we kpọkọta onwe-ha nime Shailo, irigokuru ha ibu agha. 13 Umu Israel we ziga Finehas nwa Eleeza, bú onye-nchu-àjà, ijekuru umu Reuben, na ijekuru umu Gad, na ijekuru nkera ebo Manase, rue ala Gilead; 14 ya na ndi-isi iri, otù onye-isi otù onye-isi diri ulo nna ọ bula, inọrọ ebo nile nke Israel; ha nile n'otù n'otù, ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha ka ha bu, ha diri usu nile nke nnù madu abua na ọgu iri nke Israel. 15 Ha we biakute umu Reuben, biakute kwa umu Gad, biakute kwa nkera ebo Manase, rue ala Gilead, ha we gwa ha okwu, si, 16 Otú a ka nzukọ nile nke Jehova siri, Gini bu ihe-nmekpu a nke unu mekpuworo megide Chineke Israel, isi n'iso Jehova chigharia ta, n'iwuru onwe-unu ebe-ichu-àjà, inupu isi n'okpuru Jehova ta? 17 Ọ̀ bu na ajọ omume Peoa diri ayi ntà, nke ayi nāsapughi onwe-ayi na ya rue ta, ihe-otiti ahu we si nime nzukọ Jehova, 18 na unu onwe-unu gēsi n'iso Jehova chigharia ta? ọ gēru kwa, ọ buru na unu anupu isi ta n'okpuru Jehova, na Ọ gēwesa nzukọ nile nke Israel iwe echi. 19 Otú ọ di, ọ buru na ala ihe-onwunwe-unu arua árú, gabigaranu onwe-unu rue ala ihe-onwunwe Jehova, ebe ebe-obibi Jehova nēbi, nwe-kwa-nu ihe-onwunwe n'etiti ayi: ma unu anupula isi n'okpuru Jehova, unu anupu-kwa-la isi n'okpuru ayi, n'iwuru onwe-unu ebe-ichu-àjà nābughi ebe-ichu-àjà Jehova, bú Chineke-ayi. 20 Ekan nwa Zera, ọ̀ mekpughi ihe-nmekpu n'ihe ahu ewezugara nye Jehova, ma n'aru nzukọ nile nke Israel ka iwe dikwasi? ma ọ bughi nání ya onwe-ya, bú otù onye, kubirì ume n'ajọ omume-ya. 21 Umu Reuben na umu Gad na nkera ebo Manase we za, gwa ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Israel okwu, si, 22 Chineke Nke kachasi chi nile, bú Jehova, Chineke Nke kachasi chi nile, bú Jehova, Ya onwe-ya mara, Israel kwa, ya onwe-ya gāmara; ọ buru na ọ bu nime nnupu-isi, ọ buru kwa na ọ bu nime nmekpu megide Jehova, (azọputala ayi ta, ) 23 ka ayi wuworo onwe-ayi ebe-ichu-àjà isi n'iso Jehova chigharia; ọ buru kwa na ọ bu isure àjà-nsure-ọku ma-ọbu onyinye-inata-iru-ọma n'elu ya, ọ buru kwa na ọ bu ichu ihe àjà nke àjà-udo n'elu ya, ka Jehova Onwe-ya jua ase ya; 24 ọ buru kwa na ayi emeghi nka site n'iche uche okwu, si, N'ọdi-n'iru umu-unu gāgwa umu-ayi okwu, si, Gini ka unu na Jehova, bú Chineke nke Israel, nwekọrọ? 25 n'ihi na Jehova etiyewo ókè-ala n'etiti ayi na unu, umu Reuben na umu Gad, bú Jọdan; unu enweghi òkè nime Jehova: umu-unu ewe me ka umu-ayi kwusi n'itu egwu Jehova. 26 Ayi we si, Biko, ka ayi doziere onwe-ayi iwu ebe-ichu-àjà nka, ọ bughi isure àjà-nsure-ọku, ọ bughi kwa ichu àjà: 27 kama ihe-àmà ka ọ gābu n'etiti ayi na unu, na n'etiti ọb͕ọ nile nke umu-ayi ndi gānọchi ayi, ka ayi we were àjà-nsure-ọku nile ayi, were kwa àjà nile ayi, were kwa àjà-udo nile ayi, fè òfùfè Jehova n'iru Ya; ka umu-unu we ghara isi umu-ayi n'ọdi-n'iru, Unu enweghi òkè nime Jehova. 28 Ayi we si, O gēru kwa, mb͕e ha gāsi ayi, si kwa ọb͕ọ nile nke umu-ayi n'ọdi-n'iru, otú a, na ayi gāsi, Lenu ihe-atù nke ebe-ichu-àjà Jehova, nke nna-ayi-hà mere, ọ bughi isure àjà-nsure-ọku, ọ bughi kwa ichu àjà: kama ihe-àmà ka ọ bu n'etiti ayi na unu. 29 Ya buru ayi ihe-árú inupu isi n'okpuru Jehova, na isi n'iso Jehova chigharia ta, iwu ebe-ichu-àjà isure àjà-nsure-ọku, ma-ọbu inye onyinye-inata-iru-ọma, ma-ọbu ichu àjà, nāgughi ebe-ichu-àjà Jehova, bú Chineke-ayi, di n'íru ebe-obibi-Ya. 30 Finehas, bú onye-nchu-àjà, na ndi isi nzukọ Israel, bú ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Israel, ndi soro ya je, we nu okwu nile nke umu Reuben na umu Gad na umu Manase kwuru, ọ we di nma n'anya-ha. 31 Finehas nwa Eleeza, bú onye-nchu-àjà, we si umu Reuben, si kwa umu Gad, si kwa umu Manase, Ta ka ayi mara na Jehova nọ n'etiti ayi, n'ihi na unu emekpughi ihe-nmekpu a megide Jehova: ub͕u a ka unu naputaworo umu Israel n'aka Jehova. 32 Finehas nwa Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na ndi-isi we si n'ebe umu Reuben nọ, na ebe umu Gad nọ, n'ala Gilead, lata, rue ala Kenean, lakuru umu Israel, we weghachiri ha okwu. 33 Okwu ahu we di nma n'anya umu Israel; umu Israel we gọzie Chineke, ha ekwughi kwa okwu irigokuru ha ibu agha, ibibi ala nke umu Reuben na umu Gad nēbi nime ya. 34 Umu Reuben na umu Gad we kpọsa okwu bayere ebe-ichu-àjà ahu, N'ihi na, ka ha kwuru, ihe-àmà ka ọ bu n'etiti ayi, na Jehova bu Chineke.

Joshua 23

1 O rue, mb͕e ọtutu ubọchi gasiri site na mb͕e Jehova mere ka Israel zuru ike pua n'aka ndi-iro-ha nile buruburu, mb͕e Joshua ghọrọ agadi, mb͕e ubọchi ndu-ya nāgwu, 2 na Joshua kpọrọ Israel nile, bú ndi-okenye-ha, na ndi-isi-ha, na ndi-ikpé-ha, na ndi-odozi-okwu-ha, si ha, Mu onwem aghọwo agadi, ubọchi ndum nāgwu: 3 unu onwe-unu ahuwo kwa ihe nile nke Jehova, bú Chineke-unu, meworo mba ndia nile n'ihi unu; n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, Ya onwe-ya bu onye nāluru unu ọ̀gù. 4 Lenu, emewom ka mba ndia nke fọduru dayere unu n'ihe-nketa diri ebo nile unu, site na Jọdan, ha na mba ahu nile ndi m'bipuworo, we rue oké osimiri uku ahu n'ọdida anyanwu. 5 Jehova, bú Chineke-unu, Ya onwe-ya gākwapu kwa ha n'iru unu, napu kwa ha ala-ha n'iru unu; unu gēnweta kwa ala-ha, dika Jehova, bú Chineke-unu, gwara unu okwu. 6 Di-kwa-nu ike nke-uku idebe na ime ihe nile edeworo n'akwukwọ iwu Moses, ka unu ghara isi nime ya wezuga onwe-unu n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe; 7 ka unu ghara ibà nime mba ndia, ndi fọduru n'etiti unu; unu ehota-kwa-la aha chi nile ha, unu eme-kwa-la ka ewere ha ṅua iyi, unu efè-kwa-la ha òfùfè, unu akpọ-kwa-la isi ala nye ha: 8 kama Jehova, bú Chineke-unu, ka unu gārapara n'aru, dika unu meworo rue ta. 9 Jehova nānapu kwa mba uku nke nwere ume ala-ha n'iru unu: ma unu onwe-unu, ọ dighi nwoke ọ bula guzoworo n'iru unu rue ta. 10 Otù nwoke nime unu nāchu nnù ndikom abua na ọgu iri: n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, Ya onwe-ya bu onye nāluru unu ọ̀gù, dika Ọ gwara unu okwu. 11 Lezi-kwa-nu onwe-unu anya nke-ọma, ihu Jehova, bú Chineke-unu, n'anya. 12 Ma ọ buru na unu alaghachi ma-ọli, we rapara n'aru ndi fọduru nke mba ndia, bú ndia fọduru n'etiti unu, unu na ha ewe lurita nwunye, unu ewe bakuru ha, ha ewe bakuru kwa unu: 13 maranu nke-ọma na Jehova, bú Chineke-unu, agaghi-anapu kwa mba ndia ala-ha ọzọ n'iru unu, kama ha gāburu unu ib͕udu na ọnyà, na utari n'akuku-aru-unu, na ogwu n'anya-unu, rue mb͕e unu gālapu n'iyì n'ezi ala nka, nke Jehova, bú Chineke-unu, nyeworo unu. 14 Ma, le, mu onwem nēje n'uzọ uwa nile ta: ma unu amawo n'obi-unu nile na nime nkpuru-obi-unu nile, na ọ dighi otù ihe dapuru n'ezi ihe nile nke Jehova, bú Chineke-unu, kwuru bayere unu; ha nile emeworo unu, ọ dighi otù ihe dapuru nime ya. 15 Ọ gēru kwa, na dika ezi ihe nile nke Jehova, bú Chineke-unu, gwara unu biakwasiworo unu, otú a ka Jehova gēme ka ihe ọjọ ahu nile biakwasi unu, rue mb͕e Ọ gēkpochapu unu n'ezi ala nka nke Jehova, bú Chineke-unu, nyeworo unu. 16 Mb͕e unu gāgabiga ọb͕ub͕a-ndu Jehova, bú Chineke-unu, nke O nyere unu n'iwu, mb͕e unu gēje kwa fè chi ọzọ, kpọ isi ala nye ha; iwe Jehova gādi kwa ọku n'aru unu, unu gālapu kwa n'iyì ngwa ngwa n'ezi ala ahu nke O nyeworo unu.

Joshua 24

1 Joshua we chikọta ebo nile nke Israel rue Shekem, ọ kpọ ndi-okenye Israel, na ndi-isi-ha, na ndi-ikpé-ha, na ndi-odozi-okwu-ha; ha we guzo onwe-ha n'iru Chineke. 2 Joshua we si ndi Israel nile, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, N'ofè Osimiri ahu ka nna-unu-hà biri site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, bú Tira, nna Abraham, na nna Nehoa: ha we fè chi ọzọ di iche iche. 3 M'we si n'ofè Osimiri ahu kuru nna-unu, bú Abraham, me ka ọ nēje ije n'ala Kenean nile, M'we me ka nkpuru-ya ba uba, M'we nye ya Aisak. 4 M'we nye Aisak Jekob na Isọ: M'we nye Isọ ugwu Sia, ka ọ nweta ya; ma Jekob na umu-ya ridara n'Ijipt. 5 M'we ziga Moses na Eron, tie Ijipt ihe, dika ihe ahu si di nke M'mere n'etiti ya: emesia M'we me ka unu puta. 6 M'we me ka nna-unu-hà si n'Ijipt puta: unu we biarue oké osimiri; ndi Ijipt we chiri ub͕ọ-ala na ndi-inyinya chua nna-unu-hà n'azu rue Oké Osimiri Uhie. 7 Ha we tikue Jehova, O we tiye oké ọchichiri n'etiti unu na ndi Ijipt, me ka oké osimiri biakwasi ha, O we kpuchie ha; anya-unu hu-kwa-ra ihe M'mere n'Ijipt: unu we biri n'ọzara ọtutu ubọchi. 8 M'we me ka unu ba n'ala ndi-Amorait, ndi bi n'ofè Jọdan; ha we buso unu agha: M'we nye ha n'aka-unu, unu we nweta ala-ha; M'we kpochapu ha n'iru unu. 9 Belak nwa Zipoa, bú eze Moab, we bilie buso Israel agha; o we ziga kpọ Belam nwa Beoa ikọcha unu: 10 ma ekweghm ige Belam nti; o we nāgọzi unu agọzi: M'we naputa unu n'aka-ya. 11 Unu we gabiga Jọdan, biarue Jeriko: ndi-nwe Jeriko we buso unu agha, bú ndi-Amorait, na ndi-Perizait, na ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Giagashait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus; M'we nye ha n'aka-unu. 12 M'we ziga ebu n'iru unu, nke chupuru ha n'iru unu, bú eze abua nke ndi-Amorait; ọ bughi na mma-agha-gi, ọ bughi kwa n'uta-gi. 13 M'we nye unu ala nke i nādọb͕ughi onwe-gi n'ọlu nime ya, na obodo nke unu nēwughi, unu we biri nime ha; ubi-vine na ubi-olive nke unu nākughi ka unu nēri nkpuru-ha. 14 Ma ub͕u a, nātunu egwu Jehova, nēfè-kwa-nu Ya òfùfè n'izu-okè na ezi-okwu: wezuga-kwa-nu chi nile nke nna-unu-hà fère òfùfè n'ofè Osimiri ahu, na n'Ijipt; ma fènu Jehova òfùfè. 15 Ma ọ buru na ọ jọ njọ n'anya-unu ifè Jehova òfùfè, rọputaranu onwe-unu ta onye unu gēfè òfùfè; ma ọ bu chi nile nke nna-unu-hà fère òfùfè nke di n'ofè Osimiri ahu, ma-ọbu chi nile nke ndi-Amorait, ndi unu onwe-unu bi n'ala-ha: ma mu onwem na ulom, ayi gēfè Jehova òfùfè. 16 Ndi Israel we za, si, Ya buru ayi ihe-árú irapu Jehova, ifè chi ọzọ òfùfè; 17 n'ihi na Jehova, bú Chineke-ayi, Ya onwe-ya bu onye mere ka ayi na nna-ayi-hà si n'ala Ijipt, si n'ulo ndi-orù, rigota, Onye me-kwa-ra ihe-iriba-ama uku ahu nile n'anya-ayi, debe ayi n'uzọ ahu nile nke ayi jere ije nime ya, na n'etiti ndi nile nke ayi gabigara n'etiti ha: 18 Jehova we chupu ndi ahu nile n'iru ayi, bú ndi-Amorait ndi bi n'ala nka: ayi onwe-ayi gēfè kwa Jehova òfùfè; n'ihi na Ya onwe-ya bu Chineke-ayi. 19 Joshua we si ndi Israel, Unu apughi ifè Jehova òfùfè; n'ihi na Chineke di nsọ ka Ọ bu; Chineke ekworo ka Ọ bu; Ọ gaghi-ab͕aghara njehie-unu na nmehie nile unu. 20 Mb͕e unu gārapu Jehova, fè chi ala ọzọ òfùfè, Ọ gēchighari kwa mejọ unu, me ka unu gwusia, mb͕e O mesiri unu nma. 21 Ndi Israel we si Joshua, É-è; kama Jehova ka ayi gēfè òfùfè. 22 Joshua we si ndi Israel, Ndi-àmà megide onwe-unu ka unu bu, na unu onwe-unu arọputaworo onwe-unu Jehova, ifè Ya òfùfè. Ha we si, Ndi-àmà ka ayi bu. 23 Ọ si, Ma ub͕u a, wezuganu chi ala ọzọ nile nke di n'etiti unu, do-kwa-ra Jehova, bú Chineke Israel, obi-unu. 24 Ndi Israel we si Joshua, Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi gēfè òfùfè, olu-Ya ka ayi gēge kwa nti. 25 Joshua na ndi Israel we b͕a ndu ubọchi ahu, o we doro ha ukpuru na ikpé nime Shekem. 26 Joshua we de okwu ndia n'akwukwọ iwu Chineke; o we were nkume uku, me ka o guzo ọtọ n'ebe ahu n'okpuru osisi oak ahu nke di n'ebe nsọ Jehova. 27 Joshua we si ndi Israel nile, Le, nkume a gābu àmà megide ayi; n'ihi na ọ nuwo okwu-ọnu nile nke Jehova nke Ọ gwara ayi: ọ gābu kwa àmà megide unu, ka unu we ghara igọnari Chineke-unu. 28 Joshua we zilaga ndi Israel, nwoke ọ bula n'ihe-nketa-ya. 29 O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na Joshua nwa Nun, bú orù Jehova, nwuru, mb͕e ọ b͕ara ọgu arọ ise na iri. 30 Ha we lìe ya n'ókè-ala nke ihe-nketa-ya nime Timnat-sera, nke di n'ugwu Efraim, n'akuku Ugwu nke ugwu Gaash. 31 Israel we fè Jehova òfùfè ubọchi nile nke Joshua, na ubọchi nile nke ndi-okenye ndi emere ka ubọchi-ha di anya ka Joshua nwusiri, ndi ma-kwa-ra omume nile nke Jehova, nke O mere Israel. 32 Ha we lìe ọkpukpu Josef, nke umu Israel si n'Ijipt bugota, nime Shekem, n'òkè ọhia ahu nke Jekob zutara n'aka umu Hemoa nna Shekem n'ọgu nkpuru-ego ise: ha we ghọrọ umu Josef ihe-nketa. 33 Eleeza nwa Eron we nwua; ha we lìe ya n'ugwu Finehas nwa-ya, nke enyere ya n'ugwu Efraim.

Ndi-Ikpe 1

1 O rue, mb͕e ọnwu Joshua gasiri, na umu Israel juru Jehova ase, si, Ònye gēbu uzọ rigoro ayi imegide ndi Kenean, ibuso ha agha? 2 Jehova we si, Juda gārigo: le, enyewom ala nka n'aka-ya. 3 Juda we si Simeon, bú nwa-nne-ya, Sorom rigo n'ala-ife-nzàm, ka ayi we buso ndi Kenean agha; mu onwem gēsoro kwa gi je n'ala-ife-nzà-gi. Simeon we soro ya je. 4 Juda we rigo; Jehova we nye ndi Kenean na ndi-Perizait n'aka-ha: ha we tib͕ue ha nime Bezek, orú nnù ndikom na nnù ise. 5 Ha we hu Adoni-bezek nime Bezek: ha we buso ya agha, tib͕ue ndi Kenean na ndi-Perizait. 6 Ma Adoni-bezek b͕alagara; ha we chua ya n'azu, jide ya, bipu isi-aka-ya abua na isi-ukwu-ya abua. 7 Adoni-bezek we si, Ọgu eze atọ na iri, ndi ebipuru isi-aka-ha na isi-ukwu-ha, nāchikọta ihe n'okpuru table nkem: dika m'meworo, otú a ka Chineke kwughachiworom. Ha we me ka ọ ba na Jerusalem, ọ nwua n'ebe ahu. 8 Umu Juda we buso Jerusalem agha, were ya, were ọnu nma-agha tib͕ue ya, su obodo ahu ọku. 9 Emesia umu Juda ridara ibuso ndi Kenean agha, bú ndi bi n'ugwu, na nime Negeb, na n'ebe di ala ala. 10 Juda we jekuru ndi Kenean ndi bi na Hebron: (ma aha Hebron na mb͕e gara aga bu Kiriat-aba: ) na tib͕ue Sheshai, na Ahiman, na Talmai. 11 O si n'ebe ahu jekuru ndi bi na Debia. (Ma aha Debia na mb͕e ara aga bu Kiriat-sefa. ) 12 Keleb we si, Onye ahu nke gētib͕u Kiriat-sefa, were ya, m'gēnye kwa ya Aksa, bú nwam nwayi, na nwunye. 13 Ọtniel nwa Kenaz, nwa-nne ntà Keleb, we were ya: o we nye ya Aksa, bú nwa-ya nwayi, na nwunye. 14 O rue, mb͕e Aksa biara, na ọ kpaliri di-ya iriọ ubi n'aka nna-ya: Aksa we si n'inyinya-ibu-ya rida; Keleb we si ya, Gini ka i nāchọ? 15 Ọ si ya, Nyem ngọzi; n'ihi na ọ bu ala Negeb a ka i nyeworom, gi nyekwam isi miri ufọdu. Keleb we nye ya isi miri di n'elu, na isi miri di n'okpuru. 16 Umu onye-Kinait, bú nna nwunye Moses, we si n'obodo nkwu soro umu Juda rigo n'ọzara Juda, nke di na Ndida nke Arad, ha we je biri n'etiti ndi ahu. 17 Juda we je, ya na Simeon, bú nwa-nne-ya, tib͕ue ndi Kenean ndi bi na Zefat, we wezuga ya ka ebibie ya. Ewe kpọ aha obodo ahu Họma. 18 Juda were kwa Geza na ókè-ala-ya, na Ashkelon na ókè-ala-ya, na Ekron na ókè-ala-ya. 19 Jehova nọye-kwa-ra Juda; o we nweta ugwu; ma ọ pughi inapu ndi bi na ndagwurugwu ala-ha, n'ihi na ha nwere ub͕ọ-ala ígwè. 20 Ha we nye Keleb Hebron, dika Moses kwuru: o we napu umu Anak atọ ala-ha n'ebe ahu. 21 Ma umu Benjamin anapughi ndi Jebus ndi bi na Jerusalem ala-ha: ndi Jebus we biri n'etiti umu Benjamin nime Jerusalem, rue ta. 22 Ma ulo Josef, ha onwe-ha rigoru-kwa-ra Bet-el: Jehova we nọyere ha. 23 Ulo Josef we ziga iledo Bet-el. (Ma aha obodo ahu na mb͕e gara aga bu Luz. ) 24 Ndi nēche nche we hu otù nwoke ka o nēsi n'obodo ahu puta, ha we si ya, Biko, gosi ayi nbata obodo a, ayi gēme-kwa-ra gi ebere. 25 Ọ we gosi ha nbata obodo ahu, ha we were ọnu mma-agha tib͕ue obodo ahu; ma ha zipuru nwoke ahu na ab͕uru-ya nile. 26 Nwoke ahu we je ala ndi Het, wue obodo, kpọ aha-ya Luz: nke ahu bu aha-ya rue ta. 27 Manase anapughi ndi bi na Bet-shan na umu-obodo-ya, na ndi bi na Teanak na umu-obodo-ya, na ndi bi na Doa na umu-obodo-ya, na ndi bi na Ibleam na umu-obodo-ya, na ndi bi na Megido na umu-obodo-ya, ala-ha: ma ndi Kenean jisiri ike ibiri n'ala ahu. 28 O rue, mb͕e Israel di ike, na ha tiyere ndi Kenean n'ifè-òfùfè, ma ha anapusighi ha ala-ha. 29 Efraim anapughi kwa ndi Kenean ndi bi na Gezea ala-ha; ndi Kenean we biri na Gezea n'etiti ha. 30 Zebulun anapughi ndi bi na Kitron, na ndi bi na Nahalol, ala-ha; ndi Kenean we biri n'etiti ha, ghọ ndi nọ n'ifè-òfùfè. 31 Asha anapughi kwa ndi bi n'Ako, na ndi bi na Zaidon, na Ahlab, na Akzib, na Helba, na Afik, na Rehob, ala-ha: 32 ndi Asha we biri n'etiti ndi Kenean, bú ndi bi n'ala ahu: n'ihi na ha anapughi ha ala-ha. 33 Naftali anapughi kwa ndi bi na Bet-shemesh, na ndi bi na Bet-anat, ala-ha; ha we biri n'etiti ndi Kenean, bú ndi bi na n'ala ahu: ma ndi bi na Bet-shemesh na Bet-anat ghọrọ ndi nēfè ha òfùfè. 34 Ndi-Amorait we kpagide umu Dan n'ugwu: n'ihi na ha ekweghi ka ha rida na ndagwurugwu: 35 ma ndi-Amorait jisiri ike ibiri n'ugwu Heres, na n'Ajalon, na nime Shaalbim: ma aka ulo Josef dikariri arọ́, ha we ghọ ndi nọ n'ifè-òfùfè. 36 Ókè-ala ndi-Amorait we site na nrigo Akrabim, site na ukume di elu ahu, we rigo.

Ndi-Ikpe 2

1 Onye-ozi Jehova we si na Gilgal rigorue Bokim. Ọ we si, Emerem unu ka unu si n'Ijipt rigota, M'we me ka unu bata n'ala nke M'ṅuru nna-unu-hà iyi inye ha; M'we si, M'gaghi-emebi ọb͕ub͕a-ndum rue mb͕e ebighi-ebi, bú nke Mu ńa unu b͕ara; 2 ma unu onwe-unu na ndi bi n'ala nka ab͕ala ndu; unu gākwatu ebe-ichu-aja nile ha: ma unu egeghi nti olum: gini bu nka unu meworo? 3 M'we si kwa, M'gaghi-achupu ha n'iru unu; kama ha gāburu unu ogwu n'akuku-aru-unu, chi nile ha gābu-kwa-ra unu ọnyà. 4 O rue, mb͕e onye-ozi Jehova gwasiri umu Israel nile okwu ndia, na ndi Israel weliri olu-ha, kwa ákwá. 5 Ha we kpọ aha ebe ahu Bokim: ha we chuara Jehova àjà n'ebe ahu. 6 Joshua we zilaga ndi Israel, umu Israel we la, nwoke ọ bula n'ihe-nketa-ya, inweta ala ahu. 7 Ndi Israel we fè Jehova òfùfè ubọchi nile nke Joshua, na ubọchi nile nke ndi-okenye ndi emere ka ubọchi-ha di anya ka Joshua nwusiri, ndi huru omume uku nile nke Jehova, nke O mere Israel. 8 Joshua nwa Nun, bú orù Jehova, we nwua, mb͕e ọ b͕ara ọgu arọ ise na iri. 9 Ha we lìe ya n'ókè-ala nke ihe-nketa-ya nime Timnat-heres, n'ugwu Efraim, n'akuku Ugwu nke ugwu Gaash. 10 Ewe chikọta kwa ọb͕ọ ahu nile na ndi bu nna-ha n'ala-mọ: ọb͕ọ ọzọ we bilie inọchi ha, ndi nāmaghi Jehova, ha amaghi kwa omume nke O mere Israel. 11 Umu Israel we me ihe ọjọ n'anya Jehova, fè Bealim òfùfè: 12 ha we rapu Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, Onye nēme ka ha si n'ala Ijipt puta, ha we jezo chi ọzọ, ndi sitere na chi nke ndi ahu ndi nọ ha gburugburu, ha we kpọ isi ala nye ha: we kpasue Jehova iwe. 13 Ha we rapu Jehova, fè Baal na Ashtarot òfùfè. 14 Iwe Jehova we di ọku megide Israel, O we nye ha n'aka ndi nāpunara madu ihe, ha we punara ha ihe, O renye kwa ha n'aka ndi-iro-ha gburugburu, ha apughi kwa iguzo n'iru ndi-iro-ha ọzọ. 15 Ebe ọ bula ha puru, aka Jehova adigide ha ime ha ihe ọjọ, dika Jehova kwuru, na dika Jehova ṅuru ha iyi: ewe kpab͕ue ha nke-uku. 16 Jehova we me ka ndi-ikpé bilie, ha we zọputa ha n'aka ndi nāpunara ha ihe. 17 Ọzọ kwa, ha egeghi nti ndi-ikpé-ha, n'ihi na ha soro chi ọzọ nākwa iko, we kpọ isi ala nye ha: ha siri n'uzọ ahu wezuga onwe-ha ngwa, bú nke ndi bu nna-ha jere nime ya, n'inu ihe nile Jehova nyere n'iwu; ma ha emeghi otú a. 18 Ma mb͕e Jehova mere ka ndi-ikpe biliere ha, Jehova nọye-kwara-ra onye-ikpe ahu, we zọputa ha n'aka ndi-iro-ha ubọchi nile nke onye-ikpe ahu: n'ihi na Jehova cheghariri uche n'ihi isu-ude-ha n'iru ndi nēmeb͕u ha nākpab͕u kwa ha. 19 O rue, n'ọnwu onye-ikpe ahu, na ha laghachiri, we bibie onwe-ha kari ndi bu nna-ha, n'ijeso chi ọzọ ifè ha òfùfè, na ikpọ isi ala nye ha; ha ekweghi ka ihe si n'omume nile ha, ma-ọbu n'uzọ-ha siri ike, dapu. 20 Iwe Jehova we di ọku megide Israel; O we si, N'ihi na mba nka agabigawo ọb͕ub͕a-ndum nke M'nyeworo ndi bu nna-ha n'iwu, n'ihi na ha egeghi kwa nti olum; 21 Mu onwem agaghi-anapu kwa onye ọ bula ala-ya n'iru ha ọzọ site na mba nile ndi Joshua rapuru mb͕e ọ nwuru: 22 ka M'we were ha nwa Israel, ma ha nēdebe uzọ Jehova ije ije nime ya, dika ndi bu nna-ha debere ya, ma-ọbu na ha edebeghi ya. 23 Jehova we rapu mba ahu, ghara inapu ha ala-ha ngwa ngwa; O nyeghi kwa ha n'aka Joshua.

Ndi-Ikpe 3

1 Ma ndia bu mba ndi Jehova rapuru, iji ha nwa Israel, bú ndi nile nāmaghi agha nile nke Kenean; 2 nání ka ọb͕ọ nile nke umu Israel we mara, izí ha agha, nání ndi nāmaghi ha na mb͕e gara aga; 3 bú ndi-isi ise nke ndi Filistia, na ndi Kenean nile, na ndi Zaidon, na ndi-Haivait ndi bi n'ugwu Lebanon, site n'ugwu Beal-heamon rue nbata Hemat. 4 Ha di kwa ka ewere ha nwa Israel, imara ma ha gānu ihe nile Jehova nyere n'iwu, nke O nyere ndi bu nna-ha n'iwu n'aka Moses. 5 Umu Israel we biri n'etiti ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus: 6 ha we lutara onwe-ha umu-ha ndinyom na nwunye, were umu-ha ndinyom nye umu-ha ndikom, fè kwa chi nile ha òfùfè. 7 Umu Israel we me ihe ọjọ n'anya Jehova, chezọ Jehova, bú Chineke-ha, fè Bealim na Asherot. 8 Iwe Jehova we di ọku megide Israel, O we renye ha n'aka Kushan-rishataim, bú eze Mesọpọtemia; umu Israel we fè Kushan-rishataim òfùfè arọ asatọ. 9 Umu Israel we tikue Jehova, Jehova we me ka onye-nzọputa biliere umu Israel, ọ we zọputa ha, bú Ọtniel nwa Kenaz, nwa-nne ntà Keleb. 10 Mọ nke Jehova we dikwasi ya, o we kpe Israel ikpe; ọ pua ibu agha, Jehova we nye Kushan-rishataim, bú eze Mesọpọtemia, n'aka-ya: aka-ya we di ike n'aru Kushan-rishataim. 11 Ala ahu we di jū ọgu arọ abua. Ọtniel nwa Kenaz we nwua. 12 Umu Israel we me kwa ihe ọjọ n'anya Jehova ọzọ: Jehova we me ka Eglon, bú eze Moab, di ike imegide Israel, n'ihi na ha emewo ihe ọjọ n'anya Jehova. 13 O we chikọtara onwe-ya umu Amon na Amalek, je tib͕ue Israel, ha we nweta obodo nkwu ahu. 14 Umu Israel we fè Eglon, bú eze Moab, òfùfè arọ iri na asatọ. 15 Umu Israel we tikue Jehova, Jehova we me ka onye-nzọputa biliere ha, bú Ihud nwa Gira, onye Benjamin, onye nēme aka-ekpe: umu Israel we si n'aka-ya zigara Eglon eze Moab onyinye-inata-iru-ọma. 16 Ihud we mere onwe-ya mma-agha nke nwere ọnu abua, ogologo-ya bu otù cubit; o ke ya n'okpuru uwe-nwuda-ya n'apata-ukwu aka-nri ya. 17 Ọ weta onyinye-inata-iru-ọma ahu nso Eglon eze Moab: ma Eglon bu nwoke mara abuba nke-uku. 18 O rue, mb͕e o wetasiri onyinye-inata-iru-ọma ahu nso, na o zilagara ndi nēbu onyinye-inata-iru-ọma ahu. 19 Ma ya onwe-ya si n'arusi apiri api ndi di na Gilgal laghachi, si, Okwu nzuzo ka m'nwere igwa gi, eze. Ọ si, Nọdunu du. Ndi nile ndi nēguzo ya buruburu we si n'ebe ọ nọ pua. 20 Ihud we biakute ya; ma ya onwe-ya nānọdu nání ya n'ime-ulo-elu ọjuju-oyi nke o nwere. Ihud we si, Okwu Chineke ka m'nwere igwa gi. O we si n'oche-eze-ya bilie. 21 Ihud we setipu aka-ekpe-ya, si n'apata-ukwu aka-nri ya were mma-agha ahu, ma ya n'afọ-ya: 22 isi-mma we soro kwa iru-mma ba; abuba we b͕ochipu iru-mma, na ọ dọputaghi mma-agha ahu n'afọ-ya; o we pua n'otule-ya. 23 Ihud we pua n'uzọ-nbata, mechibido ya ọnu-uzọ ime-ulo-elu ahu, kpachie ha. 24 Ma mb͕e ya onwe-ya pusiri, ndi-orù-ya batara; ha we hu, ma, le, akpachiwo ọnu-uzọ ime-ulo-elu ahu; ha si, Ọ bu nání na o nēkpuchi ukwu-ya abua n'ime-ulo ọjuju-oyi ya. 25 Ha we nēche rue mb͕e ihere mere ha: ma, le, o meghepughi ọnu-uzọ ime-ulo-elu ahu; ha we were nkpisi-ugodi, meghe ha: ma, le, onye-nwe-ha adawo n'ala nwua. 26 Ihud we wepuga onwe-ya mb͕e ọ nāb͕agwoju ha anya, ya onwe-ya we gabiga arusi ahu apiri api, wepuga onwe-ya rue Seira. 27 O rue, mb͕e ọ biara, na ọ fùru opì-ike n'ugwu Efraim, umu Israel we si n'ugwu ahu soro ya rida, ya onwe-ya we nọ n'iru ha. 28 Ọ si ha, B͕asonum n'azu: n'ihi na Jehova enyewo ndi-iro-unu, bú ndi Moab, n'aka-unu. Ha we soro ya rida, were ngabiga-miri Jọdan nile n'uzọ ije Moab, ha ekweghi kwa ka nwoke ọ bula gabiga. 29 Ha we tib͕ue Moab na mb͕e ahu, ihe ra ka orú nnù madu na nnù ise, nwoke ọ bula nke buru ibù, na nwoke ọ bula bu dìnkpà; ọ dighi kwa nwoke ọ bula wepugara onwe-ya. 30 Ewe me ka Moab ruru ala n'okpuru aka Israel n'ubọchi ahu. Ala ahu we di jū ọgu arọ anọ. 31 Mb͕e ọ gasiri Shamga nwa Anat we di, nke were ndudu eji achu ehi tib͕ue ndi Filistia, nnù ndikom na ọgu iri: ya onwe-ya kwa, ọ zọputara Israel.

Ndi-Ikpe 4

1 Umu Israel we me kwa ọzọ ihe ọjọ n'anya Jehova, mb͕e Ihud nwusiri. 2 Jehova we renye ha n'aka Jebin, bú eze Kenean, onye bu eze nime Hezoa; onye-isi usuu-ndi-agha-ya bu kwa Sisera, ma onye ahu bi nime Haroshet nke mba di iche iche ọzọ. 3 Umu Israel we tikue Jehova: n'ihi na o nwere nnù ub͕ọ-ala ígwè abua na ọgu ise; ya onwe-ya we meb͕usie umu Israel ike orú arọ. 4 Ma Debora, bú nwayi nke bu onye-amuma, bú nwunye Lapidot, ya onwe-ya nēkpe Israel ikpe na mb͕e ahu. 5 Nwayi ahu bi kwa n'okpuru nkwu Debora n'etiti Rema na Bet-el n'ugwu Efraim: umu Israel we rigokute ya ka o kpe ha ikpe. 6 O zìe kpọ Berak nwa Abinoam ka o si na Kedesh-naftali bia, ọ si ya, Ọ̀ nyeghi iwu, bú Jehova, Chineke nke Israel, si, Je, dọrọ rue n'ugwu Teboa, chiri kwa n'onwe-gi orú nnù ndikom na nnù ise sitere n'umu Naftali, site kwa n'umu Zebulun? 7 M'gadọ kwa Sisera, bú onye-isi usu-ndi-agha Jebin, rue gi aru, rue mìri-iyi Kaishon, ya na ub͕ọ-ala-ya na ìgwè ndi-ya; M'gēnye kwa ya n'aka-gi. 8 Berak we si ya, Ọ buru na i sorom je, m'gēje kwa: ma ọ buru na i soghm je, m'gaghi-eje. 9 Debora we si, Aghaghm isoro gi je: nání na ọjija-gi agaghi-adi n'ije nke gi onwe-gi nēje; n'ihi na ọ bu n'aka nwayi ka Jehova gērenye Sisera. Debora we bilie, soro Berak jerue Kedesh. 10 Berak we kpọkọta Zebulun na Naftali rue Kedesh; o we were ukwu-ya rigo, ya na orú nnù ndikom na nnù ise: Debora we soro ya rigo. 11 Ma Heba, bú onye-Kenait, siri na Ken kewapu onwe-ya, bú site n'umu Hobab nwa-nne nwunye Moses, we ma ulo-ikwū-ya rue osisi terebinth nime Zaananim, nke di n'akuku Kedesh. 12 Ha we gosi Sisera na Berak nwa Abinoam arigowo n'ugwu Teboa. 13 Sisera we kpọkọta ub͕ọ-ala-ya nile, bú nnù ub͕ọ-ala ígwè abua na ọgu ise, na ndi nile ndi soro ya, site na Haroshet nke mba di iche iche ọzọ, rue miri-iyi Kaishon. 14 Debora we si Berak, Bilie; n'ihi na nka bu ubọchi nke Jehova nyeworo Sisera n'aka-gi: Jehova, Ọ̀ pughi we je n'iru gi? Berak we si n'ugwu Teboa rida, ya na orú nnù ndikom na nnù ise ndi soro ya n'azu. 15 Jehova we were ọnu mma-agha chusa Sisera, na ub͕ọ-ala-ya nile, na ọmuma-ulo-ikwū-ya nile, n'iru Berak; Sisera we si n'ub͕ọ-ala-ya rida, b͕alaga n'ukwu-ya. 16 Ma Berak churu ub͕ọ-ala-ya nile n'azu, na n'azu ọmuma-ulo-ikwū-ya, rue Haroshet nke mba di iche iche ọzọ: ọmuma-ulo-ikwū nile nke Sisera we da n'ọnu mma-agha; ọ dighi otù nwoke fọduru. 17 Ma Sisera b͕alagara n'ukwu-ya rue ulo-ikwū Jael, bú nwunye Heba onye-Kenait: n'ihi na udo di n'etiti Jebin, bú eze Hezoa, na ulo Heba, bú onye-Kenait. 18 Jael we pua izute Sisera, si ya, Wezuga onwe-gi, onye-nwem, wezuga onwe-gi bakutem; atula egwu. O we wezuga onwe-ya bakuru ya n'ulo-ikwū, o were ákwà-ichu-oyi kpuchie ya. 19 Ọ si ya, Biko, me ka m'ṅua nwantī miri; n'ihi na akpiri kpọrọm nku. O we meghe karama-akpukpọ miri-ara-ehi, me ka ọ ṅua, o kpuchie ya. 20 Sisera we si ya, Guzo n'ọnu-uzọ ulo-ikwū, o gēru kwa, ọ buru na nwoke ọ bula abia, jua gi, si, Ọ̀ di nwoke ọ bula nọ n'ebe a? na i gāsi, É-è. 21 Jael, bú nwunye Heba, we were ǹtú ulo-ikwū, jide kwa otùtù n'aka-ya, bakuru ya nwayọ, kpọbà ǹtú ahu n'akuku egedege-iru-ya, ǹtú we kpọpue ba n'ala; n'ihi na nwoke ahu di n'oké ura, ike gwu-kwa-ra ya; o we nwua. 22 Ma, le, Berak nāchu Sisera, Jael we puta izute ya, si ya, Bia, m'gēme kwa ka i hu nwoke ahu nke gi onwe-gi nācho. O we bakuru ya; ma, le, Sisera adawo nwua, ǹtú ahu di kwa n'akuku egedege-iru-ya. 23 Chineke we me ka Jebin, bú eze Kenean, ruru ala ubọchi ahu n'iru umu Israel. 24 Aka umu Israel we nāga nēsi ike n'aru Jebin, bú eze Kenean, rue mb͕e ha bipuru Jebin, bú eze Kenean.

Ndi-Ikpe 5

1 Debora na Berak nwa Abinoam we bùa abù n'ubọchi ahu, si, 2 N'ihi na ndi-ndú nēdu edu n'Israel, N'ihi na ndi Israel were afọ-ofufo nye onwe-ha, Gọzienu Jehova. 3 Nurunu, ndi-eze; ṅanu nti, ndi-isi; Mu onwem gābùku Jehova abù, ọbuná mu onwem; M'gābùku Jehova, bú Chineke nke Israel, abù ọma. 4 Jehova, mb͕e I siri na Sia puta, Mb͕e I siri n'ọhia Edom zọ ije, Ala mara jijiji, elu-igwe bu-kwa-ra miri, Igwe-oji nile nke b͕ara ọchichiri bu-kwa-ra miri. 5 Ugwu nile rudara dika miri n'iru Jehova, Ọbuná Sainai ahu n'iru Jehova, bú Chineke nke Israel. 6 N'ubọchi Shamga nwa Anat, N'ubọchi Jael, okporo-uzọ nile ghara idi, Ndi nēje ije n'uzọ we je n'okporo-uzọ b͕agọrọ ab͕agọ. 7 Obodo ntà we ghara idi n'Israel, ha we ghara idi, Rue mb͕e mu, bú Debora, biliri, Rue mb͕e mu, bú nne n'Israel, biliri. 8 Ha rọputara chi ọhu di iche iche; Mb͕e ahu agha di n'ọnu-uzọ-ama nile: Àhuru ọta ma-ọbu ubeN'etiti orú nnù madu uzọ ise n'Israel? 9 Obim di n'ebe ndi-ònyé-ukpuru nke Israel nọ, Ndi nēwere afọ-ofufo nye onwe-ha n'etiti ndi Israel: Gọzienu Jehova. 10 Unu ndi inyinya-ibu ọcha nēbu, Ndi nānọkwasi n'uwe-nwuda, Unu na ndi nēje ije n'uzọ, Tugharinu uche. 11 N'ebe dipuru anya n'olu ndi-uta, n'etiti ebe isere miri, N'ebe aku ka ha gākọ akukọ ezi omume nile nke Jehova, Bú ezi omume nile O mere obodo ntà Ya n'Israel. Mb͕e ahu ndi Jehova ridara rue ọnu-uzọ-ama nile. 12 Teta, teta, Debora; Teta, teta, kwue okwu abù: Bilie, Berak, dọta usu ndi i dọtara n'agha n'agha, gi nwa Abinoam. 13 Mb͕e ahu ndi fọduru nime ndi di ike nke-uku, bú ndi Israel, ridara; Jehova ridara n'ihim imegide ndi-dike. 14 Ndi nkpọrọgwu-ha di nime Amalek siri n'Efraim rida; Nēso gi n'azu, Benjamin, n'etiti umu-nna-gi. Ndi-ònyé-ukpuru siri na Makia rida, Ndi ji nka-n'aka ode-akwukwọ ese ihe si-kwa-ra na Zebulun rida. 15 Ndi-isi n'Isaka nọye-kwa-ra Debora; Dika Isaka si di, otú a ka Berak di; Na ndagwurugwu ka ezigara ya n'ukwu-ya abua. Na miri-iyi nile nke ReubenKa oké nzube obi di. 16 N'ìhi gini ka i nọduru n'etiti ogige-aturu-gi, Inu ob͕ub͕u-ọ̀jà anēb͕uru ìgwè aturu? Na miri-iyi nile nke ReubenKa oké nnyocha obi di. 17 Gilead biri n'ofè Jọdan: Dan kwa, n'ìhi gini ka ọ nọ n'ub͕o? Asha nọduru n'ọnu-miri oké osimiri, Ọ bu kwa n'akuku ọwara-miri-ya nile ka o nēbi. 18 Zebulun bu ndi nyebigara ndu-ha rue ọnwu, Naftali kwa, n'elu ebe nile di elu nke ọhia. 19 Ndi-eze biara, bū agha; Mb͕e ahu ndi-eze Kenean būru agha, Nime Teanak n'akuku miri Megido: Ọ dighi urù ego ha nara. 20 N'elu-igwe ka ha si bū agha, Kpakpando si n'uzọ nile ha atuliri atuli buso Sisera agha. 21 Miri-iyi Kaishon bupuru ha, Miri-iyi ochie ahu, bú miri-iyi Kaishon. Nkpuru-obim, i nāzọda ike. 22 Mb͕e ahu ka ukwu inyinya zọsiri ikeSite n'iwuli-elu ahu nile, bú iwuli-elu nke ihe nile ya di ike. 23 Buanu Miroz ọnu, ka mọ-ozi nke Jehova siri, Buanu ndi bi nime ya ọnu nke-uku; N'ihi na ha abiaghi iyere Jehova aka, Iyere Jehova aka imegide ndi-dike. 24 Agāgọzi Jael kari ndinyom, Bú nwunye Heba onye-Kenait, Kari ndinyom n'ulo-ikwū ka agāgọzi ya. 25 Miri ka Sisera riọrọ, miri-ara-ehi ka ọ nyere ya; O weta nso ya miri-ara-ehi nke raru araru n'ọkwa ndi di ebube. 26 Aka-ya ka ọ setiri na ǹtú, Aka-nri-ya n'otùtù ndi nālu ọlu ike; O were otùtù kpọ Sisera, ọ kpọrọ ya n'isi, O we kpọpue ya, ǹtú ahu we bapue n'akuku egedege-iru-ya. 27 N'ab͕ata ukwu-ya abua ka o ruru ala, da, tọb͕ọ: N'ab͕ata ukwu-ya abua ka o ruru ala, da: Ebe o ruru ala, n'ebe ahu ka ọ dara, la n'iyì. 28 Na window-ya ka ọ lepuru anya, tie nkpu, Bú nne Sisera, site n'oghere inara ifufe, Gini mere ub͕o-ala-ya nānọ ọdù ibia? Gini mere wheel nke ub͕ọ-ala-ya nile ji la azu? 29 Ndi-isi-ya ndinyom ndi mara ihe nāza ya, E, ya onwe-ya nēkwughachiri onwe-ya okwu-ọnu-ya nile, 30 Hà achọtaghi? hà ekèghi ihe-nkwata? Otù nwa-ab͕ọghọ, umu-ab͕ọghọ abua, gādiri nwoke ọ bula, n'isi n'isi; Ihe-nkwata, bú uwe esijiri esiji, diri Sisera, Ihe-nkwata, bú uwe esijiri esiji nke akpara nke-ọma, Bú uwe esijiri esiji nke akpara nke-ọma n'akuku abua, nke diri olu ndi akwatara? 31 Otú a ka ndi-iro-Gi nile gāla n'iyi, Jehova: Ma ndi nāhu Ya n'anya gādi ka anyanwu mb͕e ọ nāputa n'ike-ya. Ala we di jū ọgu arọ abua.

Ndi-Ikpe 6

1 Umu Israel we me ihe ọjọ n'anya Jehova: Jehova we nye ha n'aka Midian arọ asa. 2 Aka Midian we di ike n'aru Israel: n'ihi Midian ka umu Israel mere onwe-ha ebe miri nērù nke di n'ugwu, na ọb͕à, na ebe ewusiri ike. 3 O rue, ọ buru na Israel agha nkpuru, na ndi Midian rigoro ya, na ndi Amalek, na umu Iru-anyanwu; ha we rigo imegide ha; 4 ha we ma ulo-ikwū-ha imegide ha, we bibie ihe-omume ala, rue ebe i gābà na Geza, ha arapughi kwa ihe nēdebe ndu n'Israel, ma ọ bu aturu, ma-ọbu ehi, ma-ọbu inyinya-ibu. 5 N'ihi na ha na anu-ulo-ha na ulo-ikwū nile ha rigoro, ha batara dika ojuju igurube n'iba-uba; ọnu-ọgugu adighi kwa ha, ọ dighi kwa camel-ha: ha we bata n'ala ibibi ya. 6 Ewe me ka Israel ghara inwe ike ma ọli n'ihi Midian; umu Israel we tikue Jehova. 7 O rue, mb͕e umu Israel tikuru Jehova n'ihi Midian, 8 na Jehova ziri otù nwoke, bú onye-amuma, jekuru umu Israel: ọ si ha, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Mu onwem mere ka unu si n'Ijipt rigota, eme-kwa-ram ka unu si n'ulo ndi-orù puta: 9 M'we naputa unu n'aka ndi Ijipt, na n'aka ndi nile nēmeb͕u unu, M'we chupu ha n'iru unu, nye unu ala-ha: 10 M'we si unu, Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu; unu atula egwu chi nile nke ndi-Amorait, ndi unu onwe-unu bi n'ala-ha: ma unu egeghi nti olum. 11 Mọ-ozi nke Jehova we bia, nọdu n'okpuru osisi terebinth ahu nke di n'Ọfra, nke Joash, bú onye Abieza, nwere: ma Gideon nwa-ya nēticha ọka wheat n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine, iwepu ya n'iru Midian. 12 Mọ-ozi nke Jehova we me ka ọ hu ya anya, si ya, Jehova nọyere gi, gi dike bu dìnkpà. 13 Gideon we si ya, Biko, onye-nwem, ọ buru na Jehova nọyere ayi, n'ìhi gini kwa ka ihe a nile dakwasiworo ayi? òle ebe kwa ka ihe-ebube-Ya nile di, nke nna-ayi-hà kọrọ ayi akukọ ha, si, Jehova, Ọ̀ meghi ka ayi si n'Ijipt rigota? ma ub͕u a Jehova arapuwo ayi, nye kwa ayi n'aka Midian. 14 Jehova we che ya iru, si, Je n'ike-gi a, zọputa Israel n'aka Midian: èzigaghm i? 15 Ọ si Ya, Biko, Onye-nwe-ayi, #M'gēji gini zọputa Israel? le, usu nnù ndikom abua na ọgu iri nkem bu nke nēnweghi ike nime Manase, mu onwem bu kwa onye pekasiri npe n'ulo nnam. 16 Jehova we si ya, N'ihi na Mu na gi gānọ, i gētib͕u kwa Midian dika otù nwoke. 17 Ọ si ya, Biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru Gi, Gi me-kwa-ram ihe-iriba-ama na Gi onwe-gi nākpayerem uka. 18 Biko, esila n'ebe a pua, rue mb͕e m'gābiakute Gi, weputa onyinyem inata iru-ọma, dọba ya n'iru Gi. Ọ si, Mu onwem gānọdu rue mb͕e i gābiaghachi. 19 Gideon we ba n'ulo, dozie nwa-ewu, na achicha ekoghi-eko nke ephah utu ọka: o tiyere anu ahu nime nkata, tiye kwa ofè n'ite, weputa ya nye ya n'okpuru osisi terebinth ahu, we weta ya nso. 20 Mọ-ozi nke Chineke we si ya, Were anu nka na achicha ekoghi-eko nka, dọba n'elu nkume a di elu, wusi kwa ofé. O me otú a. 21 Mọ-ozi nke Jehova we setipu nsọtu nkpa-n'aka nke di n'aka-ya, metu anu ahu na achicha ekoghi-eko ahu; ọku we si na nkume ahu di elu rigo, ripia anu ahu na achicha ekoghi-eko; mọ-ozi nke Jehova we pua n'anya-ya. 22 Gideon we hu na mọ-ozi nke Jehova ka ọ bu; Gideon we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! n'ihi na ahuwom mọ-ozi nke Jehova iru n'iru. 23 Jehova we si ya, Udo diri gi; atula egwu: i gaghi-anwu. 24 Gideon we wuere Jehova ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, kpọ ya Jehova-shalom: rue ta ọ digide n'Ọfra nke ndi Abieza. 25 O rue, n'abali ahu, na Jehova siri ya, Were oke-ehi nke nna-gi nwere, bú oke-ehi nke-abua, nke b͕ara arọ asa, kwadà kwa ebe-ichu-àjà Beal nke nna-gi nwere, b͕utu kwa Ashera nke di n'akuku ya: 26 wu-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, ebe-ichu-àjà n'elu ebe a siri ike, n'usoro, were kwa oke-ehi nke-abua ahu, were kwa nkù Ashera nke i gēb͕utu, sure àjà-nsure-ọku. 27 Gideon we chiri ndikom iri sitere na ndi-orù-ya, o me dika Jehova gwara ya okwu: o rue, n'ihi na ọ turu egwu ulo nna-ya na ndikom obodo-ya, ime ya n'ehihie, na o mere ya n'abali. 28 Ndikom obodo ahu we bilie n'isi-ututu, ma, le, akwaturu ebe-ichu-àjà Beal, b͕utu kwa Ashera nke di n'akuku ya, sure kwa oke-ehi nke-abua ahu n'elu ebe-ichu-àjà nke ewuru. 29 Ha we sirita onwe-ha, Ònye mere ihe a? Ha we jua ajuju, chọ kwa, si, Gideon nwa Joash emewo ihe a. 30 Ndikom obodo ahu we si Joash, Me ka nwa-gi puta, ka ọ nwua: n'ihi na ọ kwatuwo ebe-ichu-àjà Beal, na n'ihi na o b͕utuwo Ashera nke di n'akuku ya. 31 Joash we si ndi nile nke guzoro megide ya, Unu onwe-unu, ùnu gēkpere Beal ọnu-ya? ma-ọbu unu onwe-unu, ùnu gāzọputa ya? Onye nke gēkpere ya ọnu-ya, ka eme ka ọ nwua: rapu ya rue ututu; ọ buru na chi ka ọ bu, ya kpere onwe-ya ọnu-ya, n'ihi na akwatuwo ebe-ichu-àjà-ya. 32 Ọ we kpọ ya Jerubeal n'ubọchi ahu, si, Ka Beal kpegide ya, n'ihi na ọ kwatuwo ebe-ichu-àjà-ya. 33 Ndi Midian nile na ndi Amalek na umu Iru-anyanwu we chikọta onwe-ha, gabiga, ma ulo-ikwū-ha na ndagwurugwu Jezreel. 34 Mọ nke Jehova we were Gideon kpuchie Onwe-ya dika uwe; o we fùa opì-ike; Abieza we kpọkọta onwe-ha n'azu ya. 35 O we ziga ndi-ozi nime Manase nile; ha onwe-ha kpọkọta-kwa-ra onwe-ha n'azu ya: o we ziga ndi-ozi nime Asha, na nime Zebulun, na nime Naftali; ha we rigo izute ha. 36 Gideon we si Chineke, Ọ buru na I nēsi n'akam zọputa Israel, dika I kwuworo, 37 le, mu onwem nētiye aji-anu ebìri ebì n'ebe-nzọcha-ọka; ọ buru na igirigi adikwasi nání n'aji-anu ebìri ebì ahu, ma ọkpukpọ-nku adikwasi n'ala nile buruburu, m'gāmara kwa na I gēsi n'akam zọputa Israel, dika I kwuworo. 38 O we di otú a: o we bilie n'isi-ututu n'echi-ya, pikọta aji-anu ebìri ebì ahu, hichapu igirigi n'aji-anu ebìri ebì ahu, ojuju ọkwa miri. 39 Gideon we si Chineke, Ka iwe-Gi ghara idi ọku megidem, ka m'kwu kwa nání otù ub͕ò a: biko, ka m'were aji-anu ebìri ebì ahu nwa nání otù ub͕ò a; biko, ka ọkpukpọ-nku dikwasi nání n'aji-anu ebìri ebì ahu, ma ka igiriri dikwasi n'ala nile buruburu. 40 Chineke we me otú a n'abali ahu: ọkpukpọ-nku we dikwasi nání n'aji-anu ebìri ebì ahu, ma igirigi dikwasiri n'ala nile buruburu.

Ndi-Ikpe 7

1 Jerubeal (onye ahu bu Gideon), na ndi nile soro ya, we bilie n'isi-ututu, ma ulo-ikwū-ha n'akuku isi-iyi Harod: ọmuma-ulo-ikwū Midian we di n'akuku Ugwu ha, site n'ugwu ntà More, nime ndagwurugwu. 2 Jehova we si Gideon, Ndi nke nēso gi baram uba inye Midian n'aka-ha, ka Israel we ghara inya isi megidem, si, Akam azọputawom. 3 Ma ub͕u a, biko, kpọ òkù na nti ndi nka, si, Ònye nātu egwu, nāma kwa jijiji? ya laghachi, si n'ugwu Gilead b͕alaga. Orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri-na-ise we si na ndi Israel laghachi; ma orú nnù ndikom na nnù ise fọduru. 4 Jehova we si Gideon, Ndi Israel bara uba rue ub͕u a; me ka ha ridarue miri ahu, M'gānwaputa-kwa-ra gi ha n'ebe ahu: ọ gēru kwa, na onye ọ bula M'gāsi gi, Onye a gēsoro gi je, ọ bu onye ahu gēsoro gi je; ma onye ọ bula M'gāsi gi, Onye a agaghi-eso gi je, ọ bu onye ahu nāgaghi-eje. 5 O we me ka ndi Israel ridarue miri ahu: Jehova we si Gideon, Onye ọ bula nke ji ire-ya ra miri, dika nkita nāra, onye ahu ka i gēdo n'onwe-ya iche; onye ọ bula kwa nke nēruru n'ikperè-ya abua iṅu miri. 6 Ọnu-ọgugu ndi nāra miri, n'itiye aka-ha n'ọnu-ha, di ọgu ndikom iri-na-ise: ma ndi nile fọduru nime ndi Israel ruru n'ikperè-ha iṅu miri. 7 Jehova we si Gideon, Ọ bu ọgu ndikom iri-na-ise ahu ndi nāra miri ka M'gēji zọputa unu, nye kwa Midian n'aka-gi; ma ka ndi Israel nile la, onye ọ bula n'ebe nke ya. 8 Ndi ahu we were ihe-oriri-uzọ n'aka-ha, na opì-ike-ha: ma o zilagara ndikom nile nke Israel, onye ọ bula n'ulo-ikwū-ya, ma ọgu ndikom iri-na-ise ahu ka o jidere: ma ọmuma-ulo-ikwū Midian di n'okpuru ya nime ndagwurugwu ahu. 9 O rue, n'abali ahu, na Jehova siri ya, Bilie, rida imegide ọmuma-ulo-ikwū ahu; n'ihi na enyewom ya n'aka-gi. 10 Ma ọ buru na gi onwe-gi atua egwu irida, gi na Pura, bú nwa-okorọbia-gi, ridarue ọmuma-ulo-ikwū ahu: 11 i gānu kwa ihe ha nēkwu: emesia agēme kwa ka aka-gi abua di ike ka i we rida imegide ọmuma-ulo-ikwū ahu. O we rida, ya onwe-ya na Pura, bú nwa-okorọbia-ya, rue nsọtu ndi chiri ihe-ekike-agha, ndi nọ n'ọmuma-ulo-ikwū ahu. 12 Ma ndi Midian na ndi Amalek na umu Iru-anyanwu nile nāmade nime ndagwurugwu ahu dika igurube n'uba; iguta-ọgugu adighi kwa camel-ha, dika ájá nke di n'usọ oké osimiri n'uba. 13 Gideon we bia, ma, le, otù nwoke nēzere ibe-ya nrọ, si, Le, arọrọm nrọ, ma, le, buruburu achicha ọka barley nākpọre ba n'ọmuma-ulo-ikwū Midian, ọ biarue ulo-ikwū, tie ya, o we da, achicha ahu we me ka o kpue iru, ulo-ikwū ahu we tọb͕ọ n'ala. 14 Ibe-ya we za, si, Nka abughi ihe ọzọ ma-ọbughi mma-agha Gideon nwa Joash, bú nwoke Israel: Chineke enyewo Midian na ọmuma-ulo-ikwū-ya nile n'aka-ya. 15 O rue, mb͕e Gideon nuru ọzize nrọ ahu na akukọ-isi-ya, na ọ kpọrọ isi ala; o we laghachi n'ọmuma-ulo-ikwū Israel, si, Bilienu; n'ihi na Jehova enyewo ọmuma-ulo-ikwū Midian n'aka unu. 16 O we kewa ọgu ndikom iri-na-ise ahu n'usu atọ, o tiye n'aka-ha nile opì-ike, na ite nke ihe nādighi nime ha, na ọwa n'etiti ite ahu. 17 Ọ si ha, Lenum anya, me-kwa-unu otú a: ma, le, mb͕e mu onwem nābà na nsọtu ọmuma-ulo-ikwū-ha, ọ gēru kwa na, dika m'nēme, otú a ka unu gēme. 18 Mb͕e m'fùru opì-ike, mu onwem na ndi nile nke sorom, unu gāfù kwa opì-ike, ọbuná unu onwe-unu, buruburu ọmuma-ulo-ikwū ahu nile, si, Ayi diri Jehova, di-kwa-ra Gideon. 19 Gideon, na ọgu ndikom ise ndi soro ya, we ba na nsọtu ọmuma-ulo-ikwū na nmalite nche etiti abali, (ọ bu nání mb͕e ahu ka ha guzoro ndi-nche): ha we fùa opì-ike-ha, tupia kwa ite nke di n'aka-ha. 20 Usu atọ ahu we fùa opì-ike-ha, tiwa kwa ite-ha, jide kwa ọwa-ha n'aka-ekpe-ha, na opì-ike-ha n'aka-nri-ha, ifù afù: ha we tie nkpu, si, Mma-agha diri Jehova di-kwa-ra Gideon. 21 Ha we guzo, nwoke ọ bula n'ọnọdu-ya, buruburu ọmuma-ulo-ikwū ahu: ọmuma-ulo-ikwū ahu nile we b͕a ọsọ; ha we tie nkpu, b͕alaga. 22 Ha we fùa ọgu opì-ike iri-na-ise ahu, Jehova we me ka mma-agha nwoke ọ bula di n'aru ibe-ya, na n'aru ọmuma-ulo-ikwū ahu nile: ọmuma-ulo-ikwū ahu we b͕alaga rue Bet-shita n'uzọ Zerera, rue uzọ Ebel-mehola, n'akuku Tabat. 23 Ndikom Israel we si Naftali, na n'Asha, na nime Manase nile, kpọkọta onwe-ha, chua Midian n'azu. 24 Gideon we ziga ndi-ozi n'ugwu Efraim nile, si, Ridatanu izute Midian, burunu ha uzọ were miri, rue Bet-bara, bú Jọdan. Ndikom nile nke Efraim we kpọkọta onwe-ha, were miri ahu rue Bet-bara, bú Jọdan. 25 Ha we nwude ndi-isi abua nke Midian, bú Oreb na Zeeb; ha we b͕ue Oreb n'oke nkume Oreb, b͕u kwa Zeeb n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine nke Zeeb, we chua Midian: ha we wetara Gideon isi Oreb na Zeeb n'ofè Jọdan.

Ndi-Ikpe 8

1 Ndikom Efraim we si ya, Gini bu ihe a i meworo ayi, na i kpọghi ayi, mb͕e i jere ibuso Midian agha? Ha we soro ya isesi okwu ike. 2 Ọ we si ha, Gini ka m'meworo ub͕u a dika nke unu mere? Ntutukọ nkpuru ubi-vine fọduru nke Efraim, ọ̀ dighi nma kara ọghughọ-nkpuru-vine nke Abieza? 3 N'aka-unu ka Chineke nyeworo ndi-isi Midian, bú Oreb na Zeeb: ma gini ka m'puru ime dika nke unu mere? Mb͕e ahu obi-ọku-ha juru n'aru ya, mb͕e o kwuru okwu ahu. 4 Gideon we biarue Jọdan igabiga, ya onwe-ya, na ọgu ndikom iri-na-ise ahu ndi soro ya, ha nāda #mbà, ma ha nāchu achu. 5 O we si ndikom Sukot, Biko, nyenu ndi nēsom n'ukwu n'ukwu ob͕e achicha; n'ihi na ha nāda #mbà, ma mu onwem nāchu Zeba na Zalmuna, bú ndi-eze Midian. 6 Ndi-isi Sukot we si, Ọbu-aka Zeba na Zalmuna, hà di n'aka-gi ub͕u a, na ayi gēnye usu-ndi-agha-gi nri? 7 Gideon we si, N'ihi nka mb͕e Jehova gēnye Zeba na Zalmuna n'akam, m'gēwere kwa ogwu nke ọzara were kwa ùgà ticha anu-aru-unu. 8 O si n'ebe ahu rigorue Penuel, gwa ha okwu dika nka: ndikom Penuel we za ya dika ndikom Sukot zara ya. 9 O we gwa kwa ndikom Penuel okwu, si, Mb͕e m'latara n'udo, m'gākwatu ulo-elu a. 10 Ma Zeba na Zalmuna nọ nime Kakoa, ha na ọmuma-ulo-ikwū nile ha, ihe ra ka orú nnù ndikom, na nnù iri-na-asa, na ọgu iri, ndi fọduru site n'ọmuma-ulo-ikwū nile nke umu Iru-anyanwu: ma ndi daworo di orú nnù ndikom uzọ iri-na-ise, ndi nāmiputa mma-agha. 11 Gideon we rigo n'uzọ ndi bi n'ulo-ikwū n'Iru-anyanwu Noba na Jọgbeha, o tib͕ue ọmuma-ulo-ikwū ahu; n'ihi na ọmuma-ulo-ikwū ahu nọ na ntukwasi-obi na ihe agaghi-eme ha. 12 Ma Zeba na Zalmuna b͕alagara; o we chua ha; o we nwude ndi-eze abua nke Midian, bú Zeba na Zalmuna, me ka ọmuma-ulo-ikwū ahu nile ma jijiji. 13 Gideon nwa Joash we si n'agha ahu site na nrigo Heres lata. 14 Ọ nwude otù nwa-okorọbia sitere na ndikom Sukot, o we jua ya ajuju: o we dere ya aha ndi-isi Sukot na ndi-okenye-ya n'akwukwọ, ọgu ndikom atọ na iri na asa. 15 O we biakute ndikom Sukot, si, Le Zeba na Zalmuna, ndi unu taram uta bayere ha, si, Ọbu-aka Zeba na Zalmuna, hà di n'aka-gi ub͕u a, na ayi gēnye ndikom-i ndi nāda #mbà nri. 16 O were ndi-okenye obodo ahu, na ogwu ọzara na ùgà, o were ha me ka ndikom Sukot mara ihe. 17 Ọ kwatu ulo-elu Penuel, b͕ue ndikom obodo ahu. 18 Ọ si Zeba na Zalmuna, Ndikom ahu nke unu b͕uru nime Teboa, hà di aṅa? Ha si, Dika i di, otú a ka ha di; onye ọ bula di ka umu eze n'aru. 19 Ọ si, Umu-nnem, bú umu-ndikom nnem muru, ka ha bu: Jehova nādi ndu! asi na unu emewo ka ha di ndu, agaghm-eb͕uwori unu. 20 O we si Jeta, bú ọkpara-ya, Bilie, b͕ue ha. Ma nwa-okoro ahu amiputaghi mma-agha-ya: n'ihi na ọ nātu egwu, n'ihi na nání nwa-okoro ka ọ bu rue mb͕e ahu. 21 Zeba na Zalmuna we si, Gi onwe-gi bilie, dakwasi ayi: n'ihi na dika nwoke si di, otú a ka idi-ike-ya di. Gideon we bilie, b͕ue Zeba na Zalmuna, were ihe nile yiri ọnwa nke di n'olu camel-ha. 22 Ndikom Israel we si Gideon, Nāchi ayi, ma gi onwe-gi, ma nwa-gi nwoke, ma nwa nwa-gi: n'ihi na i zọputawo ayi n'aka Midian. 23 Gideon we si ha, Mu onwem agaghi-achi unu, nwam agaghi-achi kwa unu: Jehova gāchi unu. 24 Gideon we si ha, Ka m'riọ unu aririọ, nye-kwa-num, nwoke ọ bula nb͕a-aka nke ihe-nkwata-ya. (N'ihi ma ha nwere nb͕a-aka ọla-edo, n'ihi na ndi Ishmael ka ha bu. ) 25 Ha si, Ayi gēnye ha nọ̄. Ha we b͕asa uwe, tubà n'ebe ahu, nwoke ọ bula nb͕a-aka nke ihe-nkwata-ya. 26 Ọtùtù nb͕a-aka ọla-edo nile nke ọ riọrọ we di nnù shekel ọla-edo anọ na ọgu ise; nāgughi ihe nile yiri ọnwa, na ihe nile anākwuba na nti, na uwe ododo nile nke di n'aru ndi-eze Midian, nāgughi kwa ihe-inya-n'olu nile nke di n'olu camel-ha. 27 Gideon we me ya ka ọ buru ephod, guzo ya ọtọ n'obodọ-ya, bú Ọfra: Israel nile we soro ya nākwa iko n'ebe ahu: o we ghọrọ Gideon, ghọ-kwa-ra ulo-ya, ọnyà. 28 Ewe me ka Midian ruru ala n'iru umu Israel, ha ewelighi kwa isi-ha ọzọ. Ala we di jū ọgu arọ abua n'ub͕ochi Gideon. 29 Jerubeal nwa Joash we je biri n'ulo-ya. 30 Gideon nwe-kwa-ra ọgu umu-ndikom atọ na iri ndi siri n'úkwù onwe-ya puta: n'ihi na ọ nwere ọtutu ndinyom. 31 Iko-ya nwayi nke nọ na Shekem, ya onwe-ya mu-kwa-ra ya nwa-nwoke, ọ gua ya aha Abimelek. 32 Gideon nwa Joash we nwua n'ezi isi-awọ, elìe ya n'ílì Joash, bú nna-ya, n'Ọfra nke ndi Abieza. 33 O rue, mb͕e Gideon nwuru, na umu Israel laghachiri, soro Bealim nākwa iko, doro onwe-ha Beal-berit ka ọ buru chi. 34 Ma umu Israel echetaghi Jehova, bú Chineke-ha, Onye nānaputa ha n'aka ndi-iro-ha nile buruburu: 35 ha emeghi kwa ulo Jerubeal, bú Gideon, ebere, dika ezi ihe nile si di nke o mere Israel.

Ndi-Ikpe 9

1 Abimelek nwa Jerubeal we jerue Shekem, jekuru umu-nne nne-ya, gwa ha okwu, gwa kwa ab͕uru nile nke ulo nna nne-ya, si, 2 Biko, kwuenu na nti ndi nile nwe Shekem, si, Òle nke diri unu nma? na ọgu ndikom atọ na iri, bú umu-ndikom nile nke Jerubeal, nāchi unu, ma-ọbu na otù nwoke nāchi unu? cheta-kwa-unu na ọkpukpu-unu na anu-aru-unu ka m'bu. 3 Ume-nne nne-ya kwue okwu ndia nile bayere ya na nti ndi nile nwe Shekem: obi-ha we wezuga onwe-ha iso Abimelek; n'ihi na ha siri, Nwa-nne-ayi ka ọ bu. 4 Ha we nye ya ọgu ọla-ọcha atọ na iri sitere n'ulo Beal-berit, nke Abimelek ji go ndikom efu ndi obi-ha nādighi adi n'otù ebe, ha we jeso ya. 5 O we ba n'ulo nna-ya n'Ọfra, b͕ue umu-nne-ya, bú umu Jerubeal, ọgu madu atọ na iri, n'elu otù nkume: ma Jotam nwa Jerubeal nke-ntà fọduru; n'ihi na o zoro onwe-ya. 6 Ndi nile nwe Shekem we chikọta onwe-ha, ha na ulo nile nke Milo, ha we je me Abimelek ka ọ buru eze, n'akuku osisi terebinth nke ogidi ahu nke di na Shekem. 7 Ha we gosi ya Jotam, o we je guzo n'elu ugwu Geraizim, welie olu-ya, kpọ, si ha, Genum nti, unu ndi-nwe Shekem, ka Chineke we ge unu nti. 8 Osisi jere eje ite otù onye manu ka ọ buru eze-ha; ha we si osisi olive, Buru eze-ayi. 9 Osisi olive we si ha, M'gāgha manu nkem, bú nke ha ji sọpuru Chineke na madu nimem, je ifeghari n'elu osisi nile? 10 Osisi nile we si osisi fig, Gi onwe-gi bia, buru eze-ayi. 11 Osisi fig we si ha, M'gagha utọm na ezi ihe-ọmimim, je ifeghari n'elu osisi nile? 12 Osisi nile we si osisi vine, Gi onwe-gi bia, buru eze-ayi. 13 Osisi vine we si ha, M'gāgha manya ọhu nkem, bú nke nēme ka Chineke na madu ṅuria ọṅu, je ifeghari n'elu osisi nile? 14 Osisi nile we si ogwu, Gi onwe-gi bia, buru eze-ayi. 15 Ogwu we si osisi nile, Ọ buru na ọ bu n'ezi-okwu ka unu onwe-unu nētem manu iburu unu eze, bianu, b͕abànu n'okpuru ndo nkem: ma ọ buru na ọ bughi n'ezi-okwu, ka ọku si n'ogwu puta, ripia osisi cedar nile nke Lebanon. 16 Ma ub͕u a, ọ buru na ọ bu n'ezi-okwu na n'izu-okè ka unu meworo ihe a, na unu emewo Abimelek eze, ọ buru kwa na ọ bu ezi ihe ka unu meworo Jerubeal, me kwa ulo-ya, ọ buru kwa na ọ bu dika nmeso aka-ya abua si di ka unu meworo ya; 17 (n'ihi na nnam būru agha bayere unu, tufue ndu-ya n'iru ya, we naputa unu n'aka Midian: 18 ma unu onwe-unu ebiliwo imegide ulo nnam ta, b͕u kwa umu-ya ndikom, bú ọgu ndikom atọ na iri, n'elu otù nkume, me kwa Abimelek, bú nwa orù-ya nwayi, eze ndi-nwe Shekem, n'ihi na nwa-nne-unu ka ọ bu; ) 19 ma ọ buru na ọ bu n'ezi-okwu na n'izu-okè ka unu meworo Jerubeal, me kwa ulo-ya, ta, ṅurianu ọṅu n'Abimelek, ka ọ ṅuria kwa nime unu, ọbuná ya onwe-ya: 20 ma ọ buru na ọ bughi otú a, ka ọku si n'Abimelek puta, ripia ndi-nwe Shekem, na ulo Milo; ka ọku si kwa na ndi-nwe Shekem puta, si kwa n'ulo Milo puta, ripia Abimelek. 21 Jotam we b͕alaga, b͕apu, jerue Bia, biri n'ebe ahu, n'ihi Abimelek, bú nwa-nne-ya. 22 Abimelek we buru onye-isi Israel arọ atọ. 23 Chinek we zite mọ ọjọ n'etiti Abimelek na ndi-nwe Shekem; ndi-nwe Shekem we ghọb͕ue Abimelek: 24 ka ihe-ike emere ọgu umu-ndikom Jerubeal atọ na iri we bia, ka ewe tukwasi kwa ọbara-ha n'isi Abimelek, bú nwa-nne-ha, onye b͕uru ha, na n'isi ndi-nwe Shekem, ndi mere ka aka-ya abua di ike ib͕u umu-nne-ya. 25 Ndi-nwe Shekem we do ndi nēruru ya nbì n'elu ugwu nile ha, ha we punara onye ọ bula nke nāgabiga n'uzọ ahu n'akuku ha ihe: ewe gosi Abimelek. 26 Geal nwa Ebed we bia, ya na umu-nne-ya, ha we gabiga ba Shekem: ndi-nwe Shekem we tukwasi ya obi. 27 Ha we pua ba n'ubi, ghọ nkpuru ubi-vine nile ha, zọcha nkpuru-vine, me ememe otuto, ba n'ulo chi-ha, rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, kọcha Abimelek. 28 Geal nwa Ebed we si, Ònye bu Abimelek, ònye bu kwa Shekem, na ayi gēfè ya òfùfè? ọ̀ bughi nwa Jerubeal? Zebul kwa, ọ̀ bughi onye-nlekọta ihe-ya? fènu ndikom Hemoa, bú nna Shekem, òfùfè: ma gini mere ayi onwe-ayi nēfè ya òfùfè? 29 Ma ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ndi nka nọ n'akam! m'gēwezuga kwa Abimelek. O we si Abimelek, Me ka usu-ndi-agha-gi ba uba, gi puta kwa. 30 Zebul, bú onye-isi obodo ahu, we nu okwu nile nke Geal nwa Ebed, iwe-ya we di ọku. 31 O we zigara Abimelek ndi-ozi n'aghughọ, si, Le, Geal nwa Ebed na umu-nne-ya nābà nime Shekem; ma, le, ha nākpab͕u obodo a imegide gi. 32 Ma ub͕u a, bilie n'abali, gi onwe-gi na ndi gi na ha nọ, ru kwa nbì n'ọhia: 33 ọ gēru kwa, n'ututu, mb͕e anyanwu nāwa, na i gēbili n'isi-ututu, made imegide obodo: ma, le, mb͕e ya onwe-ya na ndi ya na ha nọ nāpukute gi, i gēme kwa ha dika aka-gi gāchọta. 34 Abimelek we bilie n'abali, ya na ndi nile ndi soro ya, ha we rue nbì megide Shekem n'usu anọ. 35 Geal nwa Ebed we pua, guzo n'oghere ọnu-uzọ-ama obodo: Abimelek we si n'oruru-nbì ahu bilie, ya na ndi soro ya. 36 Geal we hu ndi ahu, we si Zebul, Le, ndi ufọdu si n'elu ugwu nārida. Zebul we si ya, Ọ bu onyinyo ugwu ka gi onwe-gi nāhu dika ndikom. 37 Geal we kwu ọzọ, si, Le, ndi ufọdu si n'elu-ala nke ala nārida, otù usu si kwa n'uzọ osisi terebinth nke Meonenim nābia. 38 Zebul we si ya, Òle ebe ọnu-gi ub͕u a, na i nāsi, Ònye bu Abimelek, na ayi gēfè ya òfùfè? Nkà abughi ndi nke i juworo? biko, pua ub͕u a, buso ha agha. 39 Geal we pua ga n'iru ndi-nwe Shekem, buso Abimelek agha. 40 Abimelek we chua ya, ọ we b͕alaga n'iru ya, ọtutu madu we da meru aru, rue oghere ọnu-uzọ-ama. 41 Abimelek we nọdu n'Aruma: Zebul we chupu Geal na umu-nne-ya, ka ha we ghara ibiri na Shekem. 42 O rue n'echi-ya, na ndi ahu puru ba n'ọhia; ha we gosi Abimelek. 43 O we chiri ndi-ya, kè ha usu atọ, rue nbì n'ọhia; ọ hu, ma, le, ndi ahu si n'obodo ahu nāputa; o we bilie imegide ha, tib͕ue ha. 44 Abimelek na usu ndi soro ya we made, guzo n'oghere ọnu-uzọ-ama obodo: usu abua ahu we made imegide ndi nile nọ n'ọhia, tib͕ue ha. 45 Abimelek we buso obodo ahu agha ubọchi ahu nile; o we were obodo ahu, b͕ue ndi nọ nime ya: ọ kwatue obodo ahu, ghasa ya nnú. 46 Ndi nile nwe ulo-elu Shekem we nu ya, ba n'ulo kachasi elu nke ulo El-berit. 47 Ewe gosi Abimelek na ndi nile nwe ulo-elu Shekem achikọtawo onwe-ha. 48 Abimelek we rigo n'ugwu Zalmon, ya onwe-ya na ndi nile soro ya; Abimelek we chiri anyu-ike-ha n'aka-ya, o we b͕utue alaka osisi, welie ya, tukwasi ya n'ubu-ya: ọ si ndi soro ya, Ihe unu huworom ka m'mere, menu ngwa, menu dika m'meworo. 49 Ndi ahu nile we b͕utu kwa, nwoke ọ bula alaka-ya, ha we jeso Abimelek, tukwasi ha n'ulo ahu kachasi elu, su ulo kachasi elu ahu ọku n'isi ha; ndikom nile nke ulo-elu Shekem we nwu kwa, bú ihe ra ka nnù ndikom na ndinyom abua na ọgu iri. 50 Abimelek we jerue Tibez, ma ulo-ikwū-ya megide Tibez, were ya. 51 Ma otù ulo-elu siri ike di n'etiti obodo ahu, ndikom nile na ndinyom nile na ndi nile nwe obodo ahu we b͕alaga n'ebe ahu, mechibido onwe-ha uzọ, rigo n'elu ulo-elu ahu. 52 Abimelek we biarue ulo-elu ahu, buso ya agha, jerue nso ọnu-uzọ ulo-elu ahu iwere ọku sure ya. 53 Otù nwayi we tua aka-nkume n'isi Abimelek, tuwa eju-isi-ya. 54 O we me ngwa kpọ nwa-okorọbia nēbu ihe-agha-ya, si ya, Miputa mma-agha-gi, me ka m'nwua, ka ha we ghara ikwu okwu bayerem, si, Nwayi b͕uru ya. Nwa-okorọbia-ya we mapue ya, ọ nwua. 55 Ndikom Israel we hu na Abimelek anwuruwo, ha we la, nwoke ọ bula n'ebe nke ya. 56 Chineke we nyeghachi ihe ọjọ Abimelek, nke o mere nna-ya, n'ib͕u ọgu umu-nne-ya atọ na iri: 57 ọ bu kwa ihe ọjọ nile nke ndikom Shekem ka Chineke nyeghachiri n'isi-ha: nkọcha Jotam nwa Jerubeal we biakwasi ha.

Ndi-Ikpe 10

1 Mb͕e Abimelek nwusiri, Tola nwa Pua, nwa Dodo, bú onye Isaka, we bilie izọputa Israel; ya onwe-ya bi kwa na Shamia n'ugwu Efraim. 2 Ọ we kpe Israel ikpe orú arọ na atọ, we nwua, elìe ya na Shamia. 3 Mb͕e ọ nwusiri, Jaia, bú onye Gilead, we bilie; ọ kpe Israel ikpe orú arọ na abua. 4 Ọ nwe-kwa-ra orú umu-ndikom na iri ndi orú umu-inyinya-ibu na iri nēbu, ha nwe-kwa-ra orú obodo na iri, nke anākpọ Havot-jaia rue ta, nke di n'ala Gilead. 5 Jaia we nwua, elìe ya na Kamon. 6 Umu Israel we me kwa ihe ọjọ n'anya Jehova, fè Bealim, na Ashtarot, na chi nile nke Siria, na chi nile nke Zaidon, na chi nile nke Moab, na chi nile nke umu Amon, na chi nile nke ndi Filistia, òfùfè; ha we rapu Jehova, ha efèghi kwa Ya òfùfè. 7 Iwe Jehova we di ọku megide Israel, O we renye ha n'aka ndi Filistia, na n'aka umu Amon. 8 Ha we tipia, kpab͕u kwa umu Israel arọ ahu: arọ iri na asatọ ka ha kpab͕uru umu Israel nile ndi bi n'ofè Jọdan, n'ala ndi-Amorait, nke di na Gilead. 9 Umu Amon we gabiga Jọdan ibuso kwa Juda, na ibuso Benjamin, na ibuso ulo Efraim, agha; ewe kpab͕ue Israel nke-uku. 10 Umu Israel we tikue Jehova, si, Ayi emehiewo megide Gi, ọbuná n'ihi na ayi arapuwo Chineke-ayi, we fè Bealim òfùfè. 11 Jehova we si umu Israel, Àzọputaghm unu n'aka ndi Ijipt, na n'aka ndi-Amorait, na n'aka umu Amon, na n'aka ndi Filistia? 12 Ndi Zaidon kwa, na Amalek, na Maon, meb͕uru unu; unu we tikuem, M'we zọputa unu n'aka-ha. 13 Ma unu onwe-unu arapuwom, we fè chi ọzọ di iche iche òfùfè: n'ihi ya M'gaghi-azọputa kwa unu ọzọ. 14 Jenu, tikue chi ndi unu rọputaworo; ka ha onwe-ha zọputa unu na mb͕e nkpab͕u-unu. 15 Umu Israel we si Jehova, Ayi emehiewo: Gi onwe-gi me ayi dika ihe nile si di nke di nma n'anya-Gi; biko, nání naputa ayi ta. 16 Ha we si n'etiti ha wezuga chi ala ọzọ nile, fè Jehova òfùfè: nkpuru-obi-Ya enweghi kwa ntachi-obi n'ihi ọnọdu ọjọ nke Israel. 17 Umu Amon we kpọkọta onwe-ha, ma ulo-ikwū-ha na Gilead. Umu Israel we chikọta onwe-ha, ma ulo-ikwū-ha na Mizpa. 18 Ndi ahu, bú ndi-isi Gilead, we sirita onwe-ha, Ònye bu nwoke ahu nke gāmalite ibuso umu Amon agha? ọ gāghọrọ ndi nile bi na Gilead isi.

Ndi-Ikpe 11

1 Ma Jefta, bú onye Gilead, bu dike nke bu dìnkpà, ma ya onwe-ya bu nwa nwayi nākwa iko: ma Gilead muru Jefta. 2 Nwunye Gilead we muara ya umu-ndikom; nwunye-ya we tolite, chupu Jefta, si ya, I gaghi-eketa ihe n'ulo nna-ayi; n'ihi na nwa nwayi ọzọ ka i bu. 3 Jefta we b͕apu n'iru umu-nne-ya, biri n'ala Tob: ndikom efu we chikọta onwe-ha n'ebe Jefta nọ, ha we soro ya pua. 4 O rue, mb͕e ọtutu ubọchi gasiri, na umu Amon busoro Israel agha. 5 O rue, mb͕e umu Amon busoro Israel agha, na ndi-okenye Gilead jere ikuputa Jefta n'ala Tob: 6 ha we si Jefta, Bia, buru ayi onye-ọchi-agha, ka ayi we buso umu Amon agha. 7 Jefta we si ndi-okenye Gilead, Ùnu onwe-unu akpọghm asì, chupukwam n'ulo nnam? ma gini mere unu biakuteworom ub͕u a mb͕e unu nọ na nkpab͕u? 8 Ndi-okenye Gilead we si Jefta, N'ihi nka ka ayi biaghachikuteworo gi ub͕u a, ka i we soro ayi je, buso umu Amon agha, i gāghọ-kwa-ra ayi onye-isi, bú ndi nile bi na Gilead. 9 Jefta we si ndi-okenye Gilead, Ọ buru na unu eme ka m'lata ibuso umu Amon agha, ọ buru kwa na Jehova arara ha nye n'irum, mù onwem gāghọrọ unu onye-isi? 10 Ndi - okenye Gilead we si Jefta, Jehova bu onye nānu okwu a n'etiti ayi, ma ọ buru na ayi emeghi otú a, dika okwu-gi nile si di. 11 Jefta we jeso ndi-okenye Gilead, ndi ahu we mee ya onye-isi na onye-ọchi-agha ichi ha: Jefta we kwue okwu-ya nile n'iru Jehova nime Mizpa. 12 Jefta we ziè ndi-ozi jekuru eze umu Amon, si, Gini ka mu na gi nwekọrọ, na i biakutewom ibuso alam agha? 13 Eze umu Amon we si ndi-ozi Jefta, N'ihi na Israel were alam, mb͕e o si n'Ijipt rigota, site n'Anon we rue Jabok, ru kwa Jọdan: ma ub͕u a nyeghachi ala ahu nile n'udo. 14 Jefta we zì kwa ndi-ozi jekuru eze umu Amon ọzọ: 15 ọ si ya, Otú a ka Jefta siri, Israel eweghi ala Moab ma-ọbu ala umu Amon: 16 n'ihi na mb͕e ha siri n'Ijipt rigota, Israel we je ije n'ọzara rue Oké Osimiri Uhie, biarue Kedesh; 17 Israel we zìe ndi-ozi jekuru eze Edom, si, Biko, ka m'gabiga nime ala-gi: ma eze Edom egeghi nti. Ọzọ kwa, o ziri ndi-ozi jekuru eze Moab: ma ọ kwegh: Israel we nọdu na Kedesh. 18 O we je ije n'ọzara, ga ala Edom na ala Moab buruburu, biarue akuku ọwuwa-anyanwu ala Moab, ha we ma ulo-ikwū-ha n'ofè Anon; ma ha abaghi n'ókè-ala Moab, n'ihi na Anon bu ókè-ala Moab. 19 Israel we zìe ndi-ozi jekuru Saihon, bú eze ndi-Amorait, bú eze Heshbon; Israel we si ya, Biko, ka ayi gabiga nime ala-gi rue ebe nkem. 20 Ma Saihon atukwasighi Israel obi igabiga nime ókè-ala-ya: ma Saihon chikọtara ndi-ya nile, ha we ma ulo-ikwū-ha na Jehaz, o buso Israel agha. 21 Jehova, bú Chineke Israel, we nye Saihon na ndi-ya nile n'aka Israel, ha we tib͕ue ha: Israel we nweta ala nile nke ndi-Amorait, bú ndi bi n'ala ahu. 22 Ha we nweta ókè-ala nile nke ndi-Amorait, site n'Anon we rue Jabok, site kwa n'ọzara we rue Jọdan. 23 Ma ub͕u a Jehova, bú Chineke Israel, anapuwo ndi-Amorait ala-ha n'iru ndi-Ya, bú Israel, ọ̀ bu kwa gi onwe-gi gēnweta ha? 24 Ọ̀ bughi ihe Kemosh, bú chi-gi, nēme gi ka i nweta, ka i gēnweta? Ma onye ọ bula Jehova, bú Chineke - ayi, napuworo ala-ya n'iru ayi, nke ahu ka ayi gēnweta. 25 Ma ub͕u a, gi onwe-gi, ì di nma ma-ọli kari Belak nwa Zipoa, bú eze Moab? ọ̀ chọrọ Israel okwu ma-ọli? ma-ọbu ò busoro ha agha ma-ọli? 26 Mb͕e Israel biri na Heshbon na n'umu-obodo-ya, na n'Aroea na n'umu-obodo-ya, na n'obodo nile nke di n'akuku Anon, ọgu arọ iri-na-ise; gini mere unu anaputaghi kwa ha n'aka-ha na mb͕e ahu? 27 Mu onwem emehieghi kwa megide gi, ma gi onwe-gi nēmem ihe ọjọ n'ibusom agha: Jehova, bú Onye-ikpe, gēkpe ikpe ta n'etiti umu Israel na umu Amon. 28 Ma eze umu Amon egeghi nti okwu nile nke Jefta nke o zitere ya. 29 Mọ nke Jehova we dikwasi Jefta, o we gabiga Gilead na Manase, gabiga kwa Mizpa Gilead, si na Mizpa nke Gilead gabiga rue umu Amon. 30 Jefta we kwe Jehova nkwa, si, Ọ buru na I nye umu Amon n'akam n'ezie, 31 o gēru kwa, na ihe ọ bula nke gēsi n'ọnu-uzọ ulom puta izutem, mb͕e m'siri n'umu Amon lata n'udo, Jehova gēnwe ya, m'gēsure kwa ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku. 32 Jefta we gabiga rue umu Amon ibuso ha agha; Jehova we nye ha n'aka-ya. 33 Ọ we tib͕ue ha oké ntib͕u uku site n'Aroea we rue ebe i si ba Minit, bú orú obodo, ru kwa Ebel-Keramim. Ewe me ka umu Amon ruru ala n'iru umu Israel. 34 Jefta we bia Mizpa rue ulo-ya, ma, le, nwa-ya nwayi chiri egwú-otiti na ite-egwú nāputa izute ya: ma nání nwata ahu bu otù nwa o nwere; ọ dighi nwa-nwoke ma-ọbu nwa-nwayi o nwere ma-ọbughi nání ya. 35 O rue, mb͕e ọ huru ya, na ọ dọwara uwe-ya nile, si, Ewó, adam! i mewo ka m'ruru ala nke-uku, gi onwe-gi adiwo kwa n'etiti ndi nēmekpam aru: ma mu onwem, asaghepuworom Jehova ọnum, apughkwam ilaghachi azu. 36 Ọ si ya, Nnam, i saghepuworo Jehova ọnu-gi; mem dika ihe ahu si di nke siworo n'ọnu-gi puta; ebe Jehova bọworo gi ọ́bọ̀ n'aru ndi-iro-gi, bú n'aru umu Amon. 37 O we si nna-ya, Ka emem ihe a: ram aka ọnwa abua, ka m'we je rida rue n'elu ugwu, kwa ákwá bayere ọnọdu nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke m'nọ, mu onwem na umu-ab͕ọghọ-ibem. 38 Ọ si, Je. O we zipu ya ọnwa abua: o we je, ya onwe-ya na umu-ab͕ọghọ-ibe-ya, kwa ákwá bayere ọnọdu nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke ọ nọ n'elu ugwu. 39 O rue, n'ọgwugwu ọnwa abua, na ọ laghachikuru nna-ya, o me ya nkwa-ya nke o kwere: nwata ahu amaghi kwa nwoke. O we buru ukpuru n'Israel, 40 na umu-ndinyom Israel nēje kwa-arọ ikọ akukọ nwa-nwayi Jefta onye Gilead ubọchi anọ n'arọ.

Ndi-Ikpe 12

1 Ndikom Efraim we kpọkọta onwe-ha, gabiga akuku Ugwu; ha we si Jefta, Gini mere i gabigara ibuso umu Amon agha, ma ayi ka i nākpọghi isoro gi je? ayi gēsure ulo-gi n'isi gi n'ọku. 2 Jefta we si ha, Onye nēse okwu nke-uku ka m'buworo, mu onwem na ndim na umu Amon; m'we tikue unu, ma unu azọputaghm n'aka-ha. 3 M'we hu na unu abughi ndi nāzọputam, m'we tiye ndum n'ọbu-akam, gabiga imegide umu Amon, Jehova we nye ha n'akam: n'ìhi gini kwa ka unu rigokuteworom ta ibusom agha? 4 Jefta we chikọta ndikom nile nke Gilead, buso Efraim agha: ndikom Gilead we tib͕ue Efraim, n'ihi na ha siri, Ndi b͕apuru ab͕apu nke Efraim ka unu, bú ndi Gilead, bu, n'etiti Efraim, na n'etiti Manase. 5 Gilead we were ngabiga-miri Jọdan nile n'uzo ije Efraim: o rue, mb͕e ndi b͕apuru ab͕apu nke Efraim siri, Ka m'gabiga, na ndikom Gilead siri ya, Ọ̀ bu onye Efraim ka i bu? Ọ si, É-è; 6 ha si ya, Biko, si Shibolet; ọ si, Sibolet; n'ihi na o dozighi onwe-ya ikpọ ya nke-ọma; ha we jide ya, b͕ue ya na ngabiga-miri Jọdan: orú nnù ndikom uzọ ise na nnù ise we da mb͕e ahu site n'Efraim. 7 Jefta we kpe Israel ikpe arọ isi. Jefta, bú onye Gilead, we nwua, elìe ya n'obodo Gilead. 8 Mb͕e ọ nwusiri, Ibzan, onye sitere na Bet-lehem, we kpe Israel ikpe. 9 O nwe-kwa-ra orú umu-ndikom na iri ọ muru, ọ bu kwa orú umu-ya ndinyom na iri ka o zipuru n'èzí, orú ndinyom na iri ka o me-kwa-ra ka ha si n'èzí batara umu-ya ndikom. O we kpe Israel ikpe arọ asa. 10 Ibzan we nwua, elìe ya na Bet-lehem. 11 Mb͕e ọ nwusiri, Ilon, bú onye Zebulun, we kpe Israel ikpe; o we kpe Israel arọ iri. 12 Ilon, bú onye Zebulun, we nwua, elìe ya n'Ajalon n'ala Zebulun. 13 Mb͕e ọ nwusiri, Abdon nwa Hilel, bú onye Piraton, we kpe Israel ikpe. 14 O nwe-kwa-ra ọgu umu-ndikom abua na orú umu umu na iri, ndi ọgu umu-inyinya-ibu atọ na iri nēbu: o we kpe Israel ikpe arọ asatọ. 15 Abdon nwa Hilel, bú onye Piraton, we nwua, elìe ya na Piraton n'ala Efraim, n'ugwu ndi Amalek.

Ndi-Ikpe 13

1 Umu Israel we me kwa ihe ọjọ n'anya Jehova ọzọ; Jehova we nye ha n'aka ndi Filistia ọgu arọ abua. 2 Ma otù nwoke nke Zọra di, sitere n'ab͕uru ndi Dan, aha-ya bu Manoa; ma nwunye-ya bu nwanyi-àgà, ọ mughi kwa nwa. 3 Mọ ozi nke Jehova we me ka nwayi ahu hu ya anya, si ya, Biko, le, gi onwe-gi bu nwayi-àgà, i mughi kwa nwa: ma i gāturu ime, mua nwa-nwoke. 4 Ma ub͕u a, biko, lezie anya, aṅu-kwa-la manya-vine ma-ọbu ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, eri-kwa-la ihe ọ bula ruru árú: 5 n'ihi na, le, i gaje itu ime, mua nwa-nwoke: aguba agaghi-aga n'elu isi-ya: n'ihi na onye-Nazirait nke Chineke ka nwata ahu gābu site n'afọ: ya onwe-ya gāmalite kwa izọputa Israel n'aka ndi Filistia. 6 Nwayi ahu we bia, gwa di-ya, si, Onye nke Chineke biakuterem, n'ile ya anya ọ di kwa ka mọ-ozi nke Chineke n'ile ya anya, ọ di itu egwu nke-uku; ma ajughm ya ebe o si bia, o gosighkwam aha-ya: 7 o we sim, Le, i gaje itu ime, mua nwa-nwoke; ma ub͕u a aṅula manya-vine ma-ọbu ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, eri-kwa-la ihe ọ bula ruru árú: n'ihi na onye-Nazirait nke Chineke ka nwata ahu gābu site n'afọ rue ubọchi ọnwu-ya. 8 Manoa we riọ Jehova aririọ, si, Biko, Onye-nwe-ayi, ka onye nke Chineke ahu nke I zitere biaghachikute ayi ọzọ, ariọm I, ka o zí kwa ayi ihe ayi gēme nwata ahu nke agāmu. 9 Chineke we ge nti olu Manoa; mọ-ozi nke Chineke we biakute nwayi ahu ọzọ ka ya onwe-ya nānọdu n'ubi: ma Manoa, bú di-ya, anọyeghi ya. 10 Nwayi ahu we me ngwa, b͕a ọsọ, gosi di-ya, si ya, Le, nwoke ahu nke biakuterem ubọchi a emewo ka m'hu ya anya ọzọ. 11 Manoa we bilie, jeso nwunye-ya, biakute nwoke ahu, si ya, Gi onwe-gi, ì bu nwoke ahu nke gwara nwayi a okwu? O we si, Mu ka ọ bu. 12 Manoa we si, Ub͕u a ka okwu-gi nile rè: gini gābu ikpé bayere nwata ahu, gini gābu kwa omume-ya? 13 Mọ-ozi nke Jehova we si Manoa, N'ihe nile nke m'siri nwayi a ya lezie anya. 14 Ọ gaghi-eri ihe sitere n'ihe ọ bula nke nēsi n'osisi vine nke manya-vine puta, ya aṅu-kwa-la manya-vine na ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, ya eri-kwa-la ihe ọ bula ruru árú; ihe nile nke m'nyere ya n'iwu ka ọ gēdebe. 15 Manoa we si mọ-ozi nke Jehova, Biko, kwe ka ayi b͕ochie gi, ka ayi we dozie nwa-ewu n'iru gi. 16 Mọ-ozi nke Jehova we si Manoa, Ọ buru na i b͕ochiem, m'gaghi-eri nime nri-gi: ọ buru kwa na i me àjà-nsure-ọku, ọ bu Jehova ka i gēsurere ya. N'ihi na Manoa amaghi na mọ-ozi nke Jehova ka ọ bu. 17 Manoa we si mọ-ozi nke Jehova, Gini bu aha-gi, ka ayi we sọpuru gi mb͕e okwu-gi nile gēre? 18 Mọ-ozi nke Jehova we si ya, N'ìhi gini kwa ka i nāju ajuju bayere aham, ebe aha ahu di ebube? 19 Manoa we were nwa-ewu ahu na onyinye-inata-iru-ọma, surere ya Jehova ọku n'elu oké nkume: mọ-ozi nālu kwa oké ọlu, ma Manoa na nwunye-ya nēle ya anya. 20 O rue, mb͕e ire-ọku nēsi n'ebe-ichu-àjà ahu rigo n'elu-igwe, na mọ-ozi nke Jehova rigoro nime ire-ọku nke ebe-ichu-àjà ahu: Manoa na nwunye-ya nēle kwa ya anya; ha we da kpue iru-ha n'ala. 21 Ma mọ-ozi ahu emeghi ka Manoa na nwunye-ya hu kwa ya anya ọzọ. Mb͕e ahu Manoa mara na mọ-ozi nke Jehova ka ọ bu. 22 Manoa we si nwunye-ya, Ayi aghaghi inwu, n'ihi na ọ bu Chineke ka ayi huworo. 23 Nwunye-ya we si ya, Ọ buru na ọ tọrọ Jehova uto ime ka ayi nwua, Ọ gaghi-anarawori àjà-nsure-ọku na onyinye-inata-iru-ọma n'aka-ayi, Ọ gaghi-eme kwa ka ayi hu ihe ndia nile, Ọ gaghi-eme kwa ayi nu ihe di otú a dika na mb͕e a. 24 Nwanyi ahu we mua nwa-nwoke, kpọ aha-ya Samson: nwata ahu we tó etó, Jehova we gọzie ya. 25 Mọ nke Jehova we malite ikwali obi-ya na Mahane-dan, n'etiti Zọra na Eshtaol.

Ndi-Ikpe 14

1 Samson we ridarue Timna, hu otù nwayi nime Timna sitere n'umu-ndinyom ndi Filistia. 2 O we rigota, gosi nna-ya, gosi kwa nne-ya, si, Ahuwom otù nwayi nime Timna sitere n'umu-ndinyom ndi Filistia: ma ub͕u a, lutaram ya na nwunye. 3 Nna-ya na nne-ya we si ya, Ọ̀ dighi nwayi di n'etiti umu-ndinyom umu-nne-gi, ma-ọbu n'etiti ndim nile, na gi onwe-gi nēje iluru nwunye sitere na ndi Filistia, bú ndi anēbìghi úgwù? Samson we si nna-ya, Lutaram ya; n'ihi na ya onwe-ya ziri ezi n'anyam. 4 Ma nna-ya na nne-ya amaghi na ọ bu Jehova ka o sitere n'aka; n'ihi na uzọ Ọ gēsi megide ndi Filistia ka ya onwe-ya nāchọ. Ma na mb͕e ahu ndi Filistia nāchi Israel. 5 Samson we rida, ya na nna-ya na nne-ya, rue Timna, ha we biarue ubi-vine Timna: ma, le, nwa-ọdum tozuru etozu nāb͕ọ uja izute ya. 6 Mọ nke Jehova we dakwasi ya n'ike, o we dọwa ya dika ọ gādọwa nwa-ewu, ma ọ dighi ihe o ji n'aka-ya: ma o gosighi nna-ya, o gosighi kwa nne-ya, ihe o mere. 7 Ọ we rida, gwa nwanyi ahu okwu; o ziri ezi n'anya Samson. 8 Mb͕e ubọchi ufọdu gasiri, o we jeghachi ikuru ya, o we wezuga onwe-ya ihu ozu ọdum ahu: ma, le, ìgwè aṅu di n'ozu ọdum ahu, na manu-aṅu. 9 O we rara manu-aṅu ahu n'ọbu-aka-ya abua, we nēje, nāracha ya ka ọ nēje, o we jekuru nna-ya, jekuru kwa nne-ya, nye ha, ha we racha: ma o gosighi ha na ọ bu n'ozu ọdum ka o siri rara manu-aṅu ahu. 10 Nna-ya we ridakuru nwayi ahu: Samson we me oké oriri n'ebe ahu; n'ihi na otú a ka umu-okorọbia nēme. 11 O rue, mb͕e ha huru ya, na ha chitara orú eyì na iri ka ha nọyere ya. 12 Samson we si ha, Biko, ka m'luere unu ilu: ọ buru na unu egosim ya nke-ọma n'ubọchi asa nke oké oriri a, ọ buru na unu achọta ya, m'gēnye kwa unu orú uwe ákwà ọcha na iri na orú uwe nb͕anwe na iri: 13 ma ọ buru na unu apughi igosim ya, unu onwe-unu gēnyekwan orú uwe ákwà ọcha na iri na orú uwe nb͕anwe na iri. Ha we si ya, Lue ilu-gi, ka ayi we nu ya. 14 O we si ha, N'aru onye nēri eri ka ihe-oriri si puta, N'aru ihe di ike ka ihe-utọ si puta kwa. Ma ha apughi igosi ilu ahu n'ubọchi atọ. 15 O rue, n'ubọchi nke-asa, na ha siri nwunye Samson, Rà di-gi ọnu, ka o we gosi ayi ilu ahu, ka ayi we ghara isure gi na ulo nna-gi n'ọku: ọ̀ bu inapu ayi ihe nile ayi nwere ka unu kpọrọ ayi? ọ̀ bughi otú a? 16 Nwunye Samson we kwakwasi ya ákwá, si, Nání asì ka i nākpọm, i hughkwam n'anya: i luworo umu ndim ilu, ma mu ka i nēgosighi ya. Ọ si ya, Le, nnam na nnem ka m'nēgosighi ya, ọ̀ bu kwa gi ka m'gēgosi ya? 17 O we nākwasi ya ákwá n'ubọchi asa ahu, nke oké oriri-ha diruru: o rue, n'ubọchi nke-asa, na o gosiri ya, n'ihi na ọ kpagidesiri ya ike: o we gosi umu ndi-ya ilu ahu. 18 Ndikom obdo ahu we si ya n'ubọchi nke-asa tutu anyanwu ada, Gini di utọ kari manu-aṅu? ma-ọbu gini di ike kari ọdum? O we si ha, Ọ buru na unu ejighi nwa-ab͕ọghọ-ehim dọ ihe eji gwu ala-ubi, Unu agaghi-achọtawori ilum. 19 Mọ nke Jehova we dakwasi ya n'ike, o we ridarue Ashkelon, tib͕ue orú ndikom na iri n'etiti ha, chiri ihe-ha ọ lutara, nye ndi gosiworo ilu ahu uwe nb͕anwe. Iwe-ya we di ọku, o we rigorue ulo nna-ya. 20 Nwunye Samson we ghọrọ nwoke-ibe Samson nwunye, bú nwoke nke Samson buru ya eyì.

Ndi-Ikpe 15

1 O rue, mb͕e ubọchi ufọdu gasiri, na mb͕e obìbì ọka wheat, na Samson were nwa-ewu leta nwunye-ya; ọ si, Ka m'bakuru nwunyem n'ime-ulo. Ma nna nwunye-ya ekweghi ka ọ ba. 2 Nna-ya we si, Asirim n'ezie na i kpọrọ ya asì nke-uku; m'we nye ya nwoke-ibe-gi: nwa-nne-ya nke-ntà, ọ̀ dighi nma kari ya? biko, ka ọ nọchiri gi n'ọnọdu ya. 3 Samson we si ha, Otù ub͕ò a m'gābu onye ikpe nāmaghi kari ndi Filistia, ọ bu ezie na mu onwem nēme ha ihe ọjọ. 4 Samson we je nwude ọgu nkita-ọhia iri-na-ise, chiri ọwa, che ọdudù iru, tiye otù ọwa n'etiti ọdudù abua n'ab͕ata ha. 5 Ọ we muye ọku n'ọwa nile, zipu ha ga n'ọka guzoro eguzo nke ndi Filistia, we sure ma obo ọka ma ọka guzoro eguzo, ha na ubi-olive. 6 Ndi Filistia we si, Ònye meworo nka? Ha si, Samson, di nwa onye Timna, n'ihi na ọ narawo ya nwunye-ya, nye ya nwoke-ibe-ya. Ndi Filistia we rigo, kpọre ya na nna-ya n'ọku. 7 Samson we si ha, Ọ buru na unu eme otú a, aghaghm ibọrọ onwem ọ́bọ n'aru unu, ma emesia m'gāgha. 8 O we tib͕ue ha ntib͕u uku, ogwe-ukwu n'elu apata-ukwu: ọ we rida, nọdu nime nb͕awa nke nkume di elu, bú Itam. 9 Ndi Filistia we rigo, ma ulo-ikwū-ha nime Juda, b͕asa onwe-ha nime Lehi. 10 Ndikom Juda we si, N'ìhi gini ka unu rigotaworo megide ayi? Ha si, Ike Samson ab͕u ka ayi rigotaworo, ime ya dika o meworo ayi. 11 Nnù ndikom Juda asa na ọgu iri we ridarue nb͕awa nkume di elu, bú Itam, si Samson, Ì maghi na ndi Filistia bu ndi nāchi ayi? gini bu kwa nka i meworo ayi? Ọ si ha, Dika ha merem, otú a ka m'meworo ha. 12 Ha si ya, Ike gi ab͕u ka ayi ridataworo, inye gi n'aka ndi Filistia. Samson we si ha, Ṅuaranum iyi, ka unu we ghara idakwasim, unu onwe-unu. 13 Ha we gwa ya okwu, si, É-è; kama ayi gēkesi gi ab͕u ike, nye gi n'aka-ha: ma ayi agaghi-eme ka i nwua ma-ọli. Ha we chiri udọ̀ ọhu abua ke ya ab͕u, me ka o si na nkume ahu di elu rigota. 14 Mb͕e ya onwe-ya biaruru Lehi, ndi Filistia we tie nkpu n'izute ya: Mọ nke Jehova we dakwasi ya n'ike, udọ̀ abua nke di n'ogwe-aka-ya abua we di ka flax nke reworo n'ọku, ab͕u-ya nile we b͕azepu n'aka-ya abua. 15 O we huta ọkpukpu-àb͕à ọhu nke inyinya-ibu, setipu aka-ya, jide ya, were ya tib͕ue nnù ndikom abua na ọgu iri. 16 Samson we si, Ọkpukpu - àb͕à inyinya - ibu ka m'jiworo, otù obo, obo abua, Ọkpukpu - àb͕à inyinya - ibu ka m'jiworo tib͕u nnù ndikom abua na ọgu iri. 17 O rue, mb͕e o kwubìri okwu, na ọ tupuru ọkpukpu-àb͕à-anu ahu n'aka-ya; o we kpọ ebe ahu Remat-lehi. 18 Akpiri we kpọ ya nku nke-uku, o we kpọkue Jehova, si, Gi onwe-gi esiwo n'aka orù-gi nye nzọputa uku a: ma ub͕u a m'gānwu n'akpiri-ikpọ-nku, dabà n'aka nke ndia anēbìghi úgwù. 19 Chineke we b͕awa olùlù ahu nke di nime Lehi, miri we si nime ya puta; o we ṅua, mọ-ya we biaghachi, o we di ndu; n'ihi ya ọ kpọrọ aha-ya En-hakore, nke di na Lehi, rue ta. 20 Ọ we kpe Israel ikpe na mb͕e ndi Filistia orú arọ.

Ndi-Ikpe 16

1 Samson we jerue Geza, hu otù nwayi nākwa iko n'ebe ahu, o we bakuru ya. 2 Ewe gwa ndi Geza, si, Samson abiawo ebe a. Ha we b͕a ya buruburu, che ya anwu abali ahu nile n'ọnu-uzọ-ama obodo, nọdu du abali ahu nile, si, Ka ọ di rue ìhè ututu, ayi we b͕ue ya. 3 Samson we dina rue etiti abali, bilie n'etiti abali, jide ibo ọnu-uzọ-ama obodo, jide kwa ide-ya abua, ropu ha, tiyere nkpọrọ, tukwasi ha n'ubu-ya abua, būru ha rigo n'elu ugwu nke di n'iru Hebron. 4 O rue, mb͕e nka gasiri, na ọ huru otù nwayi n'anya na ndagwurugwu Sorek, onye aha-ya bu Delaila. 5 Ndi-isi ndi Filistia we rigokuru ya, si ya, Rà ya ọnu, hu ihe ọ bu, bú nke ike uku ya di nime ya, na ihe ayi gēji pu imegide ya, ka ayi we ke ya ab͕u iweda ya n'ala: ayi onwe-ayi gēnye kwa gi, nwoke ọ bula nime ayi, nnù ọla-ọcha abua na ọgu iri-na-ise. 6 Delaila we si Samson, Biko, gosim ihe ọ bu, bú nke ike uku gi di nime ya, na ihe agēji ke gi ab͕u iweda gi n'ala. 7 Samson we si ya, Ọ buru na ha ewere akwara ọhu asa nke anāmikọghi amikọ kem ab͕u, m'gābu kwa onye nādighi ike, di kwa ka madu ọ bula si di. 8 Ndi-isi Filistia we chigoro Delaila akwara ọhu asa nke anāmikọghi amikọ, o we were ha ke ya ab͕u. 9 Ma o nwere ndi nēche anwu nānọdu n'ime-ulo. O we si ya, Ndi Filistia nādakwasi gi, Samson. O we dọbìe akwara asa ahu, dika anādọbì eriri-nzuzu mb͕e aṅara ya ọku. Amaghi kwa ike-ya. 10 Delaila we si Samson, Le, i kwawom emò, gwam okwu-ugha: biko, gosim ub͕u a ihe agēji ke gi ab͕u. 11 Ọ si ya, Ọ buru na ha achiri udọ̀ ọhu, nke akējighi je ozi ọ bula, kesim ab͕u ike, m'gābu kwa onye nādighi ike, di kwa ka madu ọ bula si di. 12 Delaila we chiri udọ̀ ọhu, were ha ke ya ab͕u, si ya, Ndi Filistia nādakwasi gi, Samson. Ma ndi nēche anwu nānọdu n'ime-ulo. O we dọbìpu ha n'ogwe - aka - ya abua dika ogho. 13 Delaila we si Samson, Rue ub͕u a i kwawom emò, gwam okwu-ugha: gosim ihe agēji ke gi ab͕u. Ọ si ya, Ọ buru na i kpà osusu asa nke isim n'ákwà akpara. 14 O we were ǹtú ya, si ya, Ndi Filistia nādakwasi gi, Samson. O we teta n'ura-ya, were ǹtú nke ihe eji akpà ákwà na ákwà ahu akpara, bulie ije-ya. 15 Delaila we si ya, Ì si aṅa si, Ahurum i n'anya, ma obi-gi adighi n'ebe m'nọ? ub͕ò atọ a ka i kwaworom emò, ma i gosighm ihe ọ bu, bú nke ike uku gi di nime ya. 16 O rue, mb͕e o were okwu-ya nile kpagide ya ubọchi nile, sob͕u kwa ya, na nkpuru-obi-ya enweghi ntachi-obi rue ọnwu. 17 O we gosi ya obi-ya nile, si ya, Ọ dighi mb͕e aguba gara n'elu isim; n'ihi na onye-Nazirait nke Chineke ka m'bu site n'afọ nnem: ọ buru na akọpum isi, ikem gēsi n'arum wezuga onwe-ya, m'gābu kwa onye nādighi ike, di kwa ka madu nile si di. 18 Delaila we hu na o gosiri ya obi-ya nile, o we ziga kpọ ndi-isi ndi Filistia, si, Rigotanu otù ub͕ò a, n'ihi na o gosiwom obi-ya nile. Ndi-isi ndi Filistia we rigokute ya, chigota ego ahu n'aka-ha. 19 O we me ka Samson raru ura n'ikperè-ukwu-ya abua; o we malite iweda ya n'ala, ike-ya we si n'aru ya wezuga onwe-ya. 20 O we si, Ndi Filistia nādakwasi gi, Samson. O we teta n'ura-ya, si, M'gāpu dika m'nēme ub͕ò ub͕ò, we meghari aru. Ma ya onwe-ya amaghi na Jehova esiwo n'ebe ọ nọ wezuga Onwe-ya. 21 Ndi Filistia we jide ya, rukpọ anya-ya abua; ha we me ka ọ ridarue Geza, were ihe ọla abua ke ya ab͕u; o we buru onye nēgwe ọka n'ulo ndi ekere ab͕u. 22 Agiri-isi-ya we malite irute mb͕e akọpusiri ya. 23 Ndi-isi ndi Filistia we chikọta onwe-ha ichuru Degon, bú chi-ha, àjà uku, na iṅuri ọṅu: ha si, Chi-ayi enyewo Samson, bú onye-iro-ayi, n'aka-ayi. 24 Ndi ahu we hu ya, to chi-ha: n'ihi na ha siri, Chi-ayi enyewo onye-iro-ayi n'aka-ayi, bú onye nēme ka ala-ayi tọb͕ọrọ n'efu, onye me-kwa-ra ka ndi-ayi eb͕uru eb͕u ba uba. 25 O rue, mb͕e obi-ha di nma, na ha siri, Kpọnu Samson, ka ọ we mere ayi ihe-ọchì. Ha we si n'ulo ndi ekere ab͕u kpọputa Samson; o we me ihe-ọchì n'iru ha: ha we me ka o guzo n'etiti ogidi. 26 Samson we si nwa-okoro onye nēji ya n'aka, Ka m'nọduru onwem, ka m'we metu ogidi nke ulo nēguzosi ike n'elu ha aka, ka m'we dabere ha. 27 Ma ulo ahu juputara na ndikom na ndinyom; n'ebe ahu ka ndi-isi nile nke ndi Filistia nọ kwa; ihe ra ka nnù ndikom na ndinyom asa na ọgu iri nọ kwa n'elu ulo, ndi nēle ka Samson nēme ihe-ọchì. 28 Samson we kpọkue Jehova, si, Onye-nwe-ayi Jehova, biko, chetam, biko, Chineke, mekwam ka m'di ike nání otù ub͕ò a, ka m'bọ-kwa-ra onwem ọ́bọ̀ otù mb͕e n'aru ndi Filistia n'ihi anyam abua. 29 Samson we b͕akua ogidi abua nke di n'etiti, nke ulo nēguzosi ike n'elu ha, o we dabere ha, otù n'aka-nri-ya, na otù n'aka-ekpe-ya. 30 Samson we si, Ka mu onwem soro ndi Filistia nwua. O we were ike rulata onwe-ya; ulo ahu we dakwasi ndi-isi ahu, dakwasi kwa ndi nile nọ nime ya. Ndi nwuru anwu ndi o mere ka ha nwua n'ọnwu-ya we di ọtutu kari ndi o mere ka ha nwua na ndu-ya. 31 Umu-nne-ya na ulo nna-ya nile we rida, bulie ya, bugota ya, lìe ya n'etiti Zọra na Eshtaol n'ílì Manoa, bú nna-ya. O we kpe Israel ikpe orú arọ.

Ndi-Ikpe 17

1 Ma otù nwoke nke ugwu Efraim di, aha-ya bu Maika. 2 Ọ si nne-ya, Nnù ego ọla-ọcha abua na ọgu iri-na-ise ahu i nwere nke ewere ewere, nke gi onwe-gi b͕ara iyi bayere ya, i we kwu kwa ya na ntim, le, ọla-ọcha ahu di n'akam; mu onwem were ya. Nne-ya we si, Onye agọziri agọzi diri Jehova ka nwam bu. 3 Ọ we nyeghachi nne-ya nnù ego ọla-ọcha abua na ọgu iri-na-ise ahu, nne-ya we si, Edoworom Jehova ọla-ọcha ahu nsọ n'ezie site n'akam inye nwam, ime arusi apiri api na arusi awuru awu: ma ub͕u a m'gēnyeghachi gi ya. 4 Ọ we nyeghachi nne-ya ọla-ọcha ahu, nne-ya we chiri ọgu ego ọla-ọcha iri, nye onye-nnucha-ọla, o we me ya arusi apiri api na arusi awuru awu: o we di n'ulo Maika. 5 Nwoke ahu, bú Maika, we nwe ulo Chineke, o we me ephod na teraphim, mejue aka nke otù nime umu-ya ndikom, o we ghọrọ ya onye-nchu-àjà. 6 Na mb͕e ahu eze adighi n'Israel: onye ọ bula nēme ihe ziri ezi n'anya-ya. 7 Otù nwa-okorọbia di kwa nke sitere na Bet-lehem-juda, site n'ab͕uru Juda, onye ahu bu onye Livai, ya onwe-ya nānọ kwa dika ọbìa n'ebe ahu. 8 Nwoke ahu we si n'obodo ahu, bú Bet-lehem-juda, je ije inọ dika ọbìa ebe ọ gāchọta ọnọdu: o we ba n'ugwu Efraim rue ulo Maika ime ihe o ji bili ije-ya. 9 Maika we si ya, Òle ebe i si bia? O we si ya, Onye Livai ka m'bu site na Bet-lehem-juda, mu onwem nēje kwa inọ dika ọbia ebe m'gāchọta ọnọdu. 10 Maika we si ya, Biri n'ulom, ghọ-kwa-ram nna na onye-nchu-àjà, mu onwem gēnye kwa gi ego ọla-ọcha iri kwa-arọ, na nke-ekike uwe, na ihe i gēji di ndu. Onye Livai we ba nime. 11 Onye Livai we kwere ibiri n'ulo nwoke; nwa-okorọbia ahu we di ya ka otù nime umu-ya ndikom. 12 Maika we mejue aka onye Livai ahu, nwa-okorọbia ahu we ghọrọ ya onye-nchu-àjà, nọ n'ulo Maika. 13 Maika we si, Ub͕u a ka m'mara na Jehova gēmem nma, n'ihi na onye Livai burum onye-nchu-àjà.

Ndi-Ikpe 18

1 Na mb͕e ahu eze adighi n'Israel: na mb͕e ahu ebo ndi Dan nāchọrọ onwe-ha ala-nketa ibiri ebiri; n'ihi na ọ dighi ala bara n'aka-ha n'ihe-nketa n'etiti ebo Israel nile rue ubọchi ahu. 2 Umu Dan we si n'ab͕uru-ha ziga ndikom ise sitere n'ọnu-ọgugu-ha nile, bú ndi-dìnkpà, site na Zọra, site kwa n'Eshtaol, iledo ala ahu, na ileputa ya; ha we si ha, Jenu, leputanu ala ahu: ha we bia ugwu Efraim, rue ulo Maika, nọ ọnọdu-abali n'ebe ahu. 3 Mb͕e ndi ahu nọrọ nso ulo Maika, ha onwe-ha matara olu nwa-okorọbia ahu, bú onye Livai: ha we wezuga onwe-ha ba n'ebe ahu, si ya, Ònye mere ka i bia ebe a? ọ̀ bu kwa gini ka gi onwe-gi nēme n'ebe a? gini ka i nwe-kwa-ra n'ebe a? 4 O we si ha, Otú a na otú a ka Maika meworom, o gowokwam ọlu, m'we ghọrọ ya onye-nchu-àjà. 5 Ha we si ya, Biko, jua Chineke ase, ka ayi we mara ma ije-ayi, bú nke ayi onwe-ayi nēje, gāga nke-ọma. 6 Onye-nchu-àjà ahu we si ha, Jenu n'udo: na ncherita-iru Jehova ka uzọ-unu di, nke unu nēje ije nime ya. 7 Ndikom ise ahu we je, biarue Laish, hu ndi ahu nke bi n'etiti ya, ka ha nēbi na ntukwasi-obi, dika ọme-n'ala ndi Zaidon si di, nādi jū nātukwasi kwa obi; ọ dighi kwa onye nēme ka ihere me ha n'okwu ọ bula n'ala ahu, bú onye nēnweta ike nb͕ochi, n'ebe di ndi Zaidon anya ka ha bi, ọ dighi kwa ihe ha na madu nwekọrọ. 8 Ha we biakute umu-nne-ha rue Zọra na Eshtaol: umu-nne-ha we si ha, Gini ka unu onwe-unu gēkwu? 9 Ha si, Bilie, ka ayi rigo kwa imegide ha: n'ihi na ayi ahuwo ala ahu, ma, le, ọ di nma nke-uku: ùnu onwe-unu nāb͕a kwa nkiti? unu adila ume-ngwu ije na ibà inweta ala ahu. 10 Mb͕e unu biara, unu gābiakute ndi nọ na ntukwasi-obi, ala ahu sara mbara n'aka abua: n'ihi na Chineke enyewo ya n'aka-unu; bú ebe nke ọ nādighi ihe ọ bula nke di n'uwa nakọ n'ebe ahu. 11 Nnù ndikom na ọgu iri ndi ekere ihe-agha, ndi sitere n'ab͕uru ndi Dan, we si n'ebe ahu, bú Zọra na Eshtaol, bulie ije. 12 Ha we rigo, ma ulo-ikwū-ha nime Kiriat-jearim, nime Juda: n'ihi nka ka ha kpọrọ ebe ahu Mahane-dan, rue ta: le, ọ di n'azu Kirian-jearim. 13 Ha we si n'ebe ahu gabiga rue ugwu Efraim, biarue ulo Maika. 14 Ndikom ise ahu, bú ndi nējeri iledo ala Laish, we za, si umu-nne-ha, Ùnu amawo na ephod na teraphim na arusi apiri api na arusi awuru awu di n'ulo ndia? ma ub͕u a, maranu ihe unu gēme. 15 Ha we wezuga onwe-ha ba n'ebe ahu, biarue ulo nwa-okorọbia ahu, bú onye Livai, bú ulo Maika, jua ya ajuju bayere udo-ya. 16 Nnù ndikom na ọgu iri ahu ndi ekere ihe-agha-ha, bú ndi sitere n'umu Dan, nēguzo kwa n'oghere ọnu-uzọ-ama. 17 Ndikom ise ahu, bú ndi nējeri iledo ala ahu, we rigo, ba n'ebe ahu, chiri arusi ahu apiri api, na ephod ahu, na teraphim ahu, na arusi ahu awuru awu: ma onye-nchu-àjà ahu nēguzo n'oghere ọnu-uzọ-ama, ya na nnù ndikom na ọgu iri ahu ndi ekere ihe-agha. 18 Ma mb͕e ndia bara n'ulo Maika, chiri arusi ahu apiri api, na ephod ahu, na teraphim ahu, na arusi ahu awuru awu, onye-nchu-àjà ahu we si ha, Gini ka unu onwe-unu nēme? 19 Ha we si ya, B͕a nkiti, kpuchie aka n'ọnu-gi, soro ayi je, ghọ-kwa-ra ayi nna na onye-nchu-àjà: òle nke ka nma, ka i buru onye-nchu-àjà diri ulo nke otù nwoke, ma-ọbu ka i buru onye-nchu-àjà diri otù ebo na otù ab͕uru n'Israel? 20 Obi onye-nchu-àjà ahu we di nma, o we chiri ephod ahu, na teraphim ahu, na arusi apiri api ahu, ba n'etiti ndi ahu. 21 Ha we chigharia je, tiye umu-ntakiri-ha na unu-ulo-ha na àkù-ha n'iru ha. 22 Mb͕e ndi ahu nọ n'ebe di ulo Maika anya, ndikom ndi nọ n'ulo nile nke di ulo Maika nso we kpọkọta onwe-ha, chukuru umu Dan. 23 Ha we kpọ umu Dan òkù. Ha we chigharia iru-ha, si Maika, Gini nēme gi, na anākpọkọta gi na ndi-gi? 24 Ọ si, Ọ bu chim nke m'mere ka unu chiriworo, ha na onye-nchu-àjàm, unu we la, ma gini ka m'nwere ọzọ? gini bu kwa nka nke unu nāsim, Gini nēme gi? 25 Umu Dan we si ya, Ka aghara inu olu-gi n'etiti ayi, ka ndikom ndi nkpuru-obi-ha di ilu we ghara idakwasi unu, i we kpochapu ndu-gi na ndu ezi-na-ulo-gi. 26 Umu Dan we je ije-ha; Maika we hu na ndi di ike ka ha bu kari ya, o we chigharia lata n'ulo-ya. 27 Ndi ahu we chiri ihe nke Maika mereri, na onye-nchu-àjà nke o nwere, ha we biakwasi Laish, biakwasi otù ndi nādi jū nānọ kwa na ntukwasi-obi, were ọnu mma-agha tib͕ue ha, sure obodo ahu n'ọku. 28 Ma onye-nnaputa adighi, n'ihi na ebe di Zaidon anya ka ọ bu, ọ dighi kwa ihe ha na madu nwekọrọ; ebe ahu di kwa na ndagwurugwu nke di n'akuku Bet-rehob. Ha we wue obodo ahu, biri nime ya. 29 Ha we kpọ aha obodo ahu Dan, n'aha Dan, bú nna-ha, onye amuru nye Israel: otù ọ di, Laish bu aha obodo ahu na mbu. 30 Umu Dan we guzoro onwe-ha arusi ahu apiri api: Jonatan, nwa Giashom, nwa Moses, ya onwe-ya na umu-ya ndikom we buru ndi-nchu-àjà diri ebo Dan rue ubọchi emere ndi ala ahu ka ha je biri n'ala ọzọ. 31 Ha we doro onwe-ha arusi apiri api nke Maika, bú nke o mere, ubọchi nile ulo Chineke di na Shailo.

Ndi-Ikpe 19

1 O rue, na mb͕e ahu, mb͕e eze nādighi n'Israel, na otù nwoke, bú onye Livai, di nānọ dika ọbìa n'akuku azu ugwu Efraim, o we si na Bet-lehem-juda kuru n'onwe-ya nwayi bu iko. 2 Iko-ya nwayi ahu we kwa iko megide ya, si n'ebe ọ nọ la n'ulo nna-ya rue Bet-lehem-juda, nọ n'ebe ahu ubọchi ruru ọnwa anọ. 3 Nwoke-ya we bilie, jeso ya, igwa ya okwu gābà ya n'obi, ime ka ọ lata, nwa-okorọbia-ya na inyinya-ibu abua soro kwa ya je: nwayi ahu we me ka ọ ba n'ulo nna-ya: nna nwa-ab͕ọghọ ahu we hu ya, ṅuria izute ya. 4 Ọgọ-ya nwoke, bú nna nwa-ab͕ọghọ ahu, we jide ya; o we nọ n'ulo-ya ubọchi atọ: ha we rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, nọ ọnọdu-abali n'ebe ahu. 5 O rue, n'ubọchi nke-anọ, na ha biliri n'isi-ututu, o we bilie ila: nna nwa-ab͕ọghọ ahu we si ọgọ-ya, Were iberibe achicha nwe ume n'obi-gi, ma emesia unu gāla. 6 Ha we nọdu, rikọ ihe, ṅukọ kwa ihe-ọṅuṅu, ha abua: nna nwa-ab͕ọghọ ahu we si nwoke ahu, Biko, kwere, nọ ọnọdu-abali, ka obi-gi di kwa nma. 7 Nwoke ahu we bilie ila; ma ọgọ-ya rugidere ya, o we chigharia nọ ọnọdu-abali n'ebe ahu. 8 O we bilie n'isi-ututu n'ubọchi nke-ise ila; nna nwa-ab͕ọghọ ahu we si, Biko, nwe ume n'obi-gi, o we b͕agwoju ha anya rue mb͕e ubọchi rudara; ha abua we rikọ ihe. 9 Nwoke ahu we bilie ila, ya onwe-ya, na iko-ya nwayi, na nwa-okorọbia-ya; ma ọgọ-ya, bú nna nwa-ab͕ọghọ ahu, siri ya, Biko, le, ike agwu ubọchi, o rubewo anyasi, biko, nọnu ọnọdu-abali: le, ubọchi erudawo, nọ ọnọdu-abali n'ebe a, ka o we diri obi-gi nma; ma bilienu n'isi-ututu echi ije ije-unu, ka i we la n'ulo-ikwū-gi. 10 Ma nwoke ahu ekweghi inọ ọnọdu-abali, kama o biliri la, o we biarue ncherita-iru Jebus (nke ahu bu Jerusalem): inyinya-ibu abua ejikwara ejikwa nēso kwa ya, iko-ya nwayi nēso kwa ya. 11 Mb͕e ndi ahu nọ nso Jebus, ubọchi jemiri nke-uku; nwa-okorọbia ahu we si onye-nwe-ya, Biko, bia, ka ayi wezuga onwe-ayi jerue obodo a nke ndi Jebus, nọ ọnọdu-abali nime ya. 12 Onye-nwe-ya we si ya, Ayi agaghi-ewezuga onwe-ayi jerue obodo onye ala ọzọ, ebe onye sitere n'umu Israel nānọghi; kama ayi gāgabiga rue Gibea. 13 O we si nwa-okorọbia-ya, Bia, ka ayi biarue nso otù nime ebe ndia; ayi gānọ kwa ọnọdu-abali na Gibea, ma-ọbu na Rema. 14 Ha we gabiga, nēje ije-ha; anyanwu we dakpugide ha n'akuku Gibea, nke diri Benjamin. 15 Ha we wezuga onwe-ha ba n'ebe ahu, ibà inọ ọnọdu-abali na Gibea: ọ ba, nọdu n'amá obodo ahu: ma ọ dighi nwoke nāchikọta ha ba n'ulo-ya inọ ọnọdu-abali. 16 Ma, le, otù agadi nwoke siri n'ọlu-ya, bú n'ubi, bia n'anyasi; ma nwoke ahu sitere n'ugwu Efraim, ya onwe-ya nānọ kwa dika ọbìa na Gibea: ma ndikom ebe ahu bu ndi Benjamin. 17 O welie anya-ya abua, hu onye-ije ahu n'amá obodo; agadi nwoke ahu we si, Òle ebe i nēje? òle ebe i si bia kwa? 18 Ọ si ya, Ayi onwe-ayi nēsi na Bet-lehem-juda gabiga rue akuku azu ugwu Efraim; ebe ahu ka m'si bia, m'we je Bet-lehem-juda: ọ bu kwa ulo Chineke ka mu onwem nēje; ma ọ dighi nwoke nāchikọtam na ndim n'ulo-ya. 19 Otú ọ di, ma okporo-ọka ma nri-anu-ulo diri inyinya-ibu-ayi; ọzọ kwa, achicha na manya-vine dirim, di-kwara-ra orù-gi nwayi, di-kwara nwa-okorọbia nke nēso ndi-orù-gi: ọ dighi ihe ọ bula nākọ ayi. 20 Agadi nwoke ahu we si, Udo diri gi; nání, ihe nile nākọ gi dikwasim; nání, anọla ọnọdu-abali n'amá. 21 O we me ka ọ ba n'ulo-ya, gwara inyinya-ibu nri-ha: ha we sa ukwu-ha, rie ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu. 22 Mb͕e ha onwe-ha nēme ka obi-ha di nma, le, ndikom obodo ahu, bú ndikom jọb͕uru onwe-ha, b͕ara ulo ahu buruburu, nētisi aka ike n'ọnu-uzọ; ha we gwa onye-nwe ulo ahu okwu, bú agadi nwoke ahu, si, Me ka ọ puta, bú nwoke nke bara n'ulo-gi, ka ayi we mara ya. 23 Nwoke ahu, bú onye-nwe ulo, we pukuru ha, si ha, É-è, umu-nnem, biko, unu emela ihe ọjọ; ebe nwoke a bataworo n'ulom, unu emela ihe-nzuzu a. 24 Le, nwam nwayi, bú nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, na iko-ya nwayi; biko, ka m'me ka ha puta, weda-kwa-nu ha n'ala, me ha ihe di nma n'anya-unu: ma unu emela nwoke a ihe-nzuzu a. 25 Ma ndikom ahu ekweghi ige nti ya: nwoke ahu we jide iko-ya nwayi, me ka ọ putara ha n'èzí; ha we mara aru-ya, sob͕ugide ya abali ahu nile rue ututu: ha we zilaga ya na chi-ọbubọ. 26 Nwayi ahu we bia n'isi-ututu, da n'ọnu-uzọ ulo nwoke ahu ebe onye-nwe-ya nọ, rue mb͕e ìhè putara. 27 Onye-nwe-ya we bilie n'ututu, meghe ọnu-uzọ ulo ahu, we pua ije ije-ya: ma, le, nwayi ahu, bú iko-ya, adawo n'ọnu-uzọ ulo ahu, aka-ya abua di kwa na nbata-uzọ. 28 Ọ si ya, Bilie, ka ayi la; ma ọ dighi onye nāza: o we būru ya n'elu inyinya-ibu-ya; nwoke ahu we bilie, je rue ebe nke ya. 29 O we ba n'ulo-ya, were mma, jide iko-ya nwayi, bọ̀ ya, dika ọkpukpu-ya nile si di, n'ọbubọ̀ iri na abua, we zisa ya n'ókè-ala nile nke Israel. 30 O rue, na onye ọ bula nke nāhu ya anya siri, Ọ dighi mb͕e emere ka ihe di otú a di, ahughi kwa ihe di otú a site n'ubọchi umu Israel siri n'ala Ijipt rigota rue ta: tukwasinu uche na ya, b͕anu ìzù, kwu-kwa-nu okwu.

Ndi-Ikpe 20

1 Umu Israel nile we puta, ewe kpọkọta nzukọ Israel dika otù nwoke, site na Dan we rue Bia-sheba, ha na ala Gilead, n'ebe Jehova nọ na Mizpa. 2 Ndi-isi ndi Israel nile, bú ebo nile nke Israel, we guzo onwe-ha nime nkpọkọta ndi Chineke, orú nnù ọgu uzọ abua na orú nnù uzọ iri, bú ndi ji ukwu eje, ndi nāmiputa mma-agha. 3 (Ma umu Benjamin nuru na umu Israel arigowo rue Mizpa. ) Umu Israel we si, Kwuenu, ìhe ọjọ a si aṅa di? 4 Nwoke ahu, bú onye Livai, di nwayi ahu nke eb͕uru eb͕u, we za, si, Ọ bu Gibea nke diri Benjamin ka m'biara, mu onwem na ikom nwayi, inọ ọnọdu-abali. 5 Ndi-nwe Gibea we bilie megidem, b͕a ulo buruburu imegidem n'abali; mu ka ha chère ib͕u, ikom nwayi ka ha weda-kwa-ra n'ala, o we nwua. 6 M'we jide ikom nwayi, bọ̀ ya abọ̀, zisa ya n'ọhia nile nke ala-nketa Israel: n'ihi na ha emewo ihe-nzube ọjọ na ihe-nzuzu n'Israel. 7 Le, unu nile, bú umu Israel, weputanu okwu na ìzù n'onwe-unu n'ebe a. 8 Ndi Israel nile we bilie dika otù nwoke, si, Ayi agaghi-eje, onye ọ bula n'ulo-ikwū-ya, ayi agaghi-ewezuga kwa onwe-ayi, onye ọ bula ibà n'ulo-ya. 9 Ma ub͕u a nka bu ihe ayi gēme Gibea; ayi gārigo imegide ya n'ofufe-nzà; 10 ayi gēwere kwa ndikom iri nime ọgu ise nke ebo nile nke Israel, na ọgu ise nime nnù abua na ọgu iri, na nnù abua na ọgu iri nime orú nnù na nnù ise, iwetara ndi Israel ihe-oriri-uzọ, ka ha we me, mb͕e ha biaruru Geba Benjamin, dika ihe-nzuzu nile si di nke ha meworo n'Israel. 11 Ndikom nile nke Israel we chikọta onwe-ha imegide obodo ahu, dika otù nwoke ka ejikọtara ha n'otù. 12 Ebo Israel nile we zisa ndikom n'ebo Benjamin, si, Gini bu ihe ọjọ a nke emeworo ka ọ di n'etiti unu? 13 Ma ub͕u a nyenu ayi ndikom ahu, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, ndi nọ na Gibea, ka ayi we me ka ha nwua, ka ayi kpochapu kwa ihe ọjọ n'Israel. Ma umu Benjamin ekweghi ige nti olu umu-nne-ha, bú umu Israel. 14 Umu Benjamin we si n'obodo nile ha chikọta onwe-ha rue Gibea, ipu ibuso umu Israel agha. 15 Umu Benjamin we gukọta onwe-ha n'ubọchi ahu site n'obodo nile ha, orú nnù uzọ atọ na nnù ise, bú ndikom nāmiputa mma-agha, nāgughi ndi bi na Gibea, ndi gukọtara onwe-ha, nnù ndikom na ọgu iri-na-ise ndi arọputara arọputa. 16 N'etiti ndi nka nile nnù ndikom na ọgu iri-na-ise ndi arọputara arọputa di, ndi nēme aka-ekpe; onye ọ bula nime ha nāmata otù agiri-isi nkume, ghara imahie. 17 Ma ndikom Israel gukọtara onwe-ha, orú ọgu uzọ abua na orú nnù uzọ iri, bú ndikom nāmiputa mma-agha, nāgughi Benjamin: ndia nile bu ndikom agha. 18 Umu Israel we bilie, rigorue Bet-el, jua Chineke ase; ha we si, Ònye gēbu uzọ rigoro ayi ibuso umu Benjamin agha? Jehova we si, Juda gēbu uzọ. 19 Umu Israel we bilie n'ututu, ma ulo-ikwū-ha megide Gibea. 20 Ndikom Israel we pua ibuso Benjamin agha; ndikom Israel we do agha n'usoro megide ha na Gibea. 21 Umu Benjamin we si na Gibea puta, bibi rue ala n'etiti Israel n'ubọchi ahu orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri-na-ise. 22 Ndi ahu, bú ndikom Israel, we me onwe-ha ka ha di ike, ha we do kwa agha n'usoro ọzọ n'ebe ha doro onwe-ha n'usoro n'ubọchi mbu. 23 (Umu Israel we rigo, kwa ákwá n'iru Jehova rue anyasi; ha we jua Jehova ase, si, M'gābiaru kwa nso ọzọ ibuso umu Benjamin, bú nwa-nnem, agha? Jehova we si, Rigonu megide ya. ) 24 Umu Israel we biarue nso imegide umu Benjamin n'ubọchi nke-abua. 25 Benjamin we si na Gibea puta izute ha n'ubọchi nke-abua ahu, ha we bibie ọzọ rue ala n'etiti umu Israel orú nnù ndikom uzọ abua na nnù ise; ndia nile nāmiputa mma-agha. 26 Umu Israel nile, na ndi ahu nile, we rigo, biarue Bet-el, kwa ákwá, nọdu n'ebe ahu n'iru Jehova, bue ọnu n'ubọchi ahu rue anyasi; ha we sure àjà-nsure-ọku na àjà-udo n'iru Jehova. 27 Umu Israel we jua Jehova ase, (n'ihi na n'ebe ahu ka ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Chineke di na mb͕e ahu, 28 Finehas, nwa Eleeza, nwa Eron, nēguzo kwa n'iru ya na mb͕e ahu, ) si, M'gapu kwa ọzọ ibuso umu Benjamin, bú nwa-nnem, agha, ma-ọbu #m'gāgha? Jehova we si, Rigonu; n'ihi na echi ka M'gēnye ya n'aka-gi. 29 Israel we do ndi nēru nbì megide Gibea buruburu. 30 Umu Israel we rigo megide umu Benjamin n'ubọchi nke-atọ, do onwe-ha n'usoro megide Gibea, dika ha mere ub͕ò abua gara aga. 31 Umu Benjamin we pua izute ndi Israel, ewe dọpu ha n'obodo; ha we malite itib͕u ufọdu n'etiti ndi Israel na ib͕u ha, dika ha mere ub͕ò abua gara aga, n'uzo abua atuliri atuli, nke otù nime ha nārigo Bet-el, otù nārigo kwa Gibea, n'ọhia, ihe ra ka orú ndikom na iri nime Israel. 32 Umu Benjamin we si, Anētib͕u ha n'iru ayi, dika na mbu. Ma umu Israel siri, Ka ayi b͕alaga, si n'obodo dọputa ha n'uzọ atuliri atuli. 33 Ndikom nile nke Israel we si n'ọnọdu-ha bilie, do onwe-ha n'usoro na Beal-tema: ndi Israel ndi nēru nbì nāwaputa kwa n'ọnọdu-ha, na Maare-geba. 34 Orú nnù ndikom na nnù ise ndi arọputara arọputa n'Israel nile we bia na ncherita-iru Gibea, agha ahu we di arọ́: ma ndi Benjamin amaghi na ihe ọjọ nēmetu ha aru. 35 Jehova we tib͕ue Benjamin n'iru Israel: umu Israel we bibie orú nnù ndikom uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri-na-ise nime Benjamin ubọchi ahu: ndia nile nāmiputa mma-agha. 36 Umu Benjamin we hu na etib͕uru ha: n'ihi na ndikom Israel nyere Benjamin uzọ, n'ihi na ha tukwasiri obi na ndi nēru nbì ndi ha doro imegide Gibea. 37 Ndi nēru nbì we je ọsọsọ, made imegide Gibea; ndi nēru nbì we dọrọ onwe-ha rue obodo, were ọnu mma-agha tib͕ue obodo ahu nile. 38 Ma ihe-iriba-ama akara àkà nke diri ndikom Israel na ndi nēru nbì bu nka, na ha gēme ka oké nkwuli anwuru-ọku si n'obodo ahu rigo. 39 Ndikom Israel we chigharia n'agha ahu, Benjamin we malite itib͕u ufọdu n'etiti ndikom Israel na ib͕u ha, ihe ra ka orú ndikom na iri: n'ihi na ha siri, N'ezie ndi etib͕uworo nọ̄ n'iru ayi ka ha bu, dika n'agha mbu. 40 Nkwuli anwuru ahu we malite isi n'obodo ahu rigo, buru ogidi anwuru-ọku, Benjamin we gha anya n'azu ha, ma, le, obodo ahu dum rigoro n'anwuru-ọku rue elu-igwe. 41 Ndikom Israel we chigharia, ndikom Benjamin we ma jijiji: n'ihi na ha huru na ihe ọjọ emetuwo ha aru. 42 Ha we chigharia n'iru ndikom Israel rue uzọ ọzara; ma agha ahu sogidesiri ha ike; ndi siri n'obodo nile puta nēbibi ha n'etiti ha. 43 Ha we b͕a Benjamin buruburu, chua ha, zọkwasi ha ukwu n'ebe-izu-ike-ha, rue na ncherita-iru Gibea n'akuku ọwuwa-anyanwu. 44 Orú nnù ndikom uzò abua na nnù ise nke Benjamin we da; ndia nile bu ndi-dìnkpà. 45 Ha we chigharia b͕alaga n'uzọ ọzara rue nkume di elu, bú Rimon: ha we ghọrọ ha, bú nnù ndikom iri-na-abua na ọgu iri, n'uzọ atuliri atuli, we sogidesi ha ike rue Gidom, tib͕ue nime ha nnù ndikom ise. 46 Ndi nile ndi si na Benjamin da n'ubọchi ahu di orú nnù ndikom uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri ndi nāmiputa mma-agha; ndia nile bu ndi-dìnkpà. 47 Ma nnù ndikom na ọgu iri chighariri b͕alaga n'uzọ ọzara rue nkume di elu, bú Rimon, nọdu na nkume di elu, bú Rimon, ọnwa anọ. 48 Ndikom Israel we laghachikuru umu Benjamin, were ọnu mma-agha tib͕ue ha, site n'obodo ndikom rue anu-ulo na ihe ọ bula nke achọtara achọta; ọzọ kwa, obodo nile nke ha chọtara, ha suru ha ọku.

Ndi-Ikpe 21

1 Ma ndikom Israel ṅuru iyi na Mizpa, si, Ọ dighi nwoke ọ bula nime ayi gēnye Benjamin nwa-ya nwayi na nwunye. 2 Ndi Israel we biarue Bet-el, nọdu n'ebe ahu rue anyasi n'iru Chineke, welie olu-ha, kwa ákwá nke-uku. 3 Ha we si, Jehova, bú Chineke nke Israel, n'ìhi gini ka nka di n'Israel, na agāgupu otù ebo n'Israel ta? 4 O rue, n'echi-ya, na ndi Israel biliri n'isi-ututu, wue ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, sure àjà-nsure-ọku na àjà-udo. 5 Umu Israel we si, Ònye nọ n'etiti ebo nile nke Israel nke nārigokuteghi Jehova nime nkpọkọta? N'ihi na ọṅuǹu-iyi uku di bayere onye ahu nke nārigokuteghi Jehova rue Mizpa, si, Aghaghi ime ka ọ nwua. 6 Umu Israel we cheghari uche bayere Benjamin, bú nwa-nne-ha, si, Ebipuru otù ebo n'Israel ta. 7 Gini ka ayi gēmere ha, bú ndi fọduru, inye ha nwunye, ebe ayi onwe-ayi were Jehova ṅua iyi na ayi agaghi-enye ha nime umu-ayi ndinyom na nwunye? 8 Ha we si, Ònye bu onye ahu n'etiti ebo Israel nile nke nārigokuteghi Jehova rue Mizpa? Ma, le, ọ dighi nwoke si na Jebesh-gilead bata n'ọmuma-ulo-ikwū rue nkpọkọta ahu. 9 Ndi Israel we gukọta onwe-ha, ma, le, ọ dighi nwoke sitere na ndi bi na Jebesh-gilead nọ n'ebe ahu. 10 Nzukọ Israel we ziga n'ebe ahu orú nnù ndikom na nnù iri sitere na ndi bu dìnkpà, ha we nye ha iwu, si, Jenu, were ọnu mma-agha tib͕ue ndi bi na Jebesh-gillead, ha na ndinyom na umu-ntakiri. 11 Nka bu kwa ihe unu gēme; unu gēwezuga nwoke ọ bula na nwayi ọ bula nke mara ndina nwoke, ka ebibie ya. 12 Ha we chọta n'etiti ndi bi na Jebesh-gilead nnù umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke site na ndina nwoke: ha we me ka ha biarue ọmuma-ulo-ikwū rue Shailo nke di n'ala Kenean. 13 Nzukọ Israel nile we ziga, gwa umu Benjamin okwu, bú ndi nọ na nkume di elu, bú Rimon, we kpọ ha òkù udo. 14 Benjamin we lata na mb͕e ahu; ha we nye ha ndinyom ahu ndi ha mere ka ha di ndu site na ndinyom Jebesh-gilead: ma ha achọtaghi nwunye gēzuru ha nile otú a. 15 Ndi Israel we cheghari uche bayere Benjamin, n'ihi na Jehova emewo ntiwa n'ebo Israel nile. 16 Ndi-okenye nzukọ Israel we si, Gini ka ayi gēmere ndi fọduru inye ha nwunye, n'ihi na ekpochapuwo ndinyom nime Benjamin? 17 Ha we si, Ihe-nnweta nke ndi b͕apuru ab͕apu ka ala nke Benjamin bu, ka aghara ihichapu ebo n'Israel. 18 Ma ayi onwe-ayi apughi inye ha nwunye sitere n'umu-ayi ndinyom: n'ihi na umu Israel ṅuru iyi, si, Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nēnye Benjamin nwunye. 19 Ha we si, Le, ememe Jehova di na Shailo kwa-arọ, nke di n'akuku Ugwu Bet-el, n'akuku ọwuwa-anyanwu nke uzọ atuliri atuli nke nārigo site na Bet-el rue Shekem, na n'akuku Ndida nke Lebona. 20 Ha we nye umu Benjamin iwu, si, Jenu, che anwu n'ubi-vine; 21 hu-kwa-nu, ma, le, ọ buru na umu-ndinyom Shailo aputa ite egwú nime otiti-egwú-ha, unu gēsi kwa n'ubi-vine puta, nwudere onwe-unu, nwoke ọ bula nwunye-ya, site n'umu-ndinyom Shailo, la n'ala Benjamin. 22 O gēru kwa, mb͕e ndi bu nna-ha ma-ọbu umu-nne-ha biara ichọ ayi okwu, na ayi gāsi ha, Nyenu ayi ha n'amara: n'ihi na ayi anwudeghi nye nwoke ọ bula nwùnye-ya n'agha: ma unu onwe-unu eweghi ha nye ha; ma ọ bughi otú a, ikpe gāma unu ub͕u a. 23 Umu Benjamin we me otú a, kuru nwunye, dika ọnu-ọgugu-ha si di, site na ndinyom nēte egwū, ndi ha nāpunara ndi Shailo: ha we je lata n'ihe-nketa-ha, wue obodo-ha, biri nime ha. 24 Umu Israel we si n'ebe ahu la na mb͕e ahu, nwoke ọ bula ọ lakuru ebo-ya, lakuru ab͕uru-ya, ha we si n'ebe ahu pua, nwoke ọ bula rue ihe-nketa-ya. 25 Na mb͕e ahu eze adighi n'Israel, onye ọ bula nēme ihe ziri ezi n'anya-ya.

Rut 1

1 O rue, na mb͕e ndi-ikpe n=ekpe, na ok/e unwu di n> ala. Ot#u nwoke nke Bet-lehem-juda we je inọ dika ọb#ia n> ala-ọhia Moab, ya onwe-ya, na nwunye-ya, na umu-ya ndikom abua. 2 Aha nwoke ahu bu Elimelek, aha nwunye-ya bu Naomi, aha umu-ya ndikom abua bu Mahlon na Kilion, ndi Efrat nke Bet-lehem-juda. Ha we ba n> ala-ọhia Moab, nọ n> ebe ahu. 3 Elimelek, b/u di Naomi, we nwua; ma nwayi ahu na umu-ya ndikom abua fọduru. 4 Ha we lutara onwe-ha nwunye sitere n> umu-ndinyom Moab; aha ot#u bu Opa, aha nke-ọzọ bu Rut: ha we biri n> ebe ahu ihe ra ka arọ iri. 5 Mahlon na Kilion we nwu kwa, ha abua; o we fọdu n/an/i nwayi ahu site n> umu-ya abua site kwa na di-ya. 6 O we bilie, ya onwe-ya na nwunye abua nke umu-ya, ka o we si n> ala-ọhia Moab lata: n> ihi na ọ nuru n> ala-ọhia Moab na Jehova eletawo ndi-ya n> inye ha nri. 7 O we si n> ebe ọ nọ pua, ya na nwunye abua nke umu-ya; ha we je n> uzọ ilata n> ala Juda. 8 Naomi we si nwunye abua nke umu-ya, Jenu, laghachi, nwayi ọ bula n> ulo nne-ya: Jehova mere unu ebere, dika unu mere ndi nwuru anwu, me-kwa-ra mu onwem. 9 Jehova me ka unu chọta izu-ike, nwayi ọ bula n> ulo di-ya. O we sutu ha ọnu; ha we welie olu-ha kwa /akw/a. 10 Ha we si ya, N> ezie ayi g=esoro gi laghachikuru ndi-gi. 11 Naomi we si, Laghachinu, umum: n> #ihi gini ka unu g=esom la? #enwerem umu-ndikom ọzọ n> afọm, ka ha we buru unu di? 12 Laghachinu, umum, lanu; n> ihi na emewom agadi kari inwe di. O buru na asim, Enwerem olile-anya, ọ buru kwa na nwoke aluam n> abali a, ọ buru kwa na amuam umu-ndikom; 13 #ọ bu ha ka unu g=anele anya rue mb͕e ha g=etolite? #ọ bu n> ihi ha ka unu g=eb͕ochi onwe-unu ka nwoke ghara ilu unu na nwunye? /e-#e, umum; n> ihi na ọ dim ilu nke-uku kari ka ọ di unu, n> ihi na aka Jehova aputawo imegidem. 14 Ha we welie olu-ha, kwa /akw/a ọzọ: Opa we sutu nne di-ya ọnu; ma Rut rapara n> aru ya. 15 O we si, Le, nwunye nwa-nne di-gi alaghachikuruwo ndi-ya, laghachikuru chi-ya: gi soro nwunye nwa-nne di-gi laghachi. 16 Rut we si, ariọlam irapu gi, isi n> iso gi laghachi: n> ihi na ebe i n=eje ka m> g=eje; ọ bu kwa ebe i n=anọ ọnọdu-abali ka m> g=anọ ọnọdu-abali: ndi-gi g=abu ndim, Chineke-gi g=abu kwa Chinekem: 17 ebe i nwuru ka m> g=anwu, ọ bu kwa n> ebe ahu ka ag=el#im: Jehova mem ot/u a, mekwam ihe ọzọ ot/u a, mb͕e ihe n=abughi ọnwu onwe-ya g=ekewa mu na gi. 18  O we hu na nwayi ahu n=ab͕a obi-ya ume iso ya je, o we ghara igwa ya okwu ọzọ. 19 Ha abua we n=eje rue mb͕e ha bara Bet-lehem. O rue, mb͕e ha bara Bet-lehem, na obodo ahu nile b͕ara aghara bayere ha, ndinyom we si, # O bu Naomi, b/u nka? 20  O si ha, Unu akpọlam Naomi, kpọnum Mara: n> ihi na Onye Nke puru ime ihe nile meworom ihe-ilu nke-uku. 21 Mu onwem, n> aka-ojuju ka m> jere, ma Jehova emewo ka m> b͕ara aka lata: n> #ihi gini ka unu n=akpọm Naomi, mb͕e Jehova b͕agiderem #am#a, Onye Nke puru ime ihe nile emejọwokwam? 22 Naomi we lata, ya na Rut, b/u nwayi Moab, b/u nwunye nwa-ya, onye siri n> ala-ọhia Moab lata: ndi ahu we ba Bet-lehem na nmalite ob#ib#i ọka barley.

Rut 2

1 Ma Naomi nwere ot#u onye di-ya mara, b/u dike n> #ak#u, sitere n> ab͕uru Elimelek, aha-ya bu Boaz. 2 Rut, b/u nwayi Moab, we si Naomi, Biko, ka m> je n> ubi, chikọta ihe n> etiti oko ọka n> azu onye m> g=ahuta amara n> iru ya. O si ya, Je, nwam. 3 O we je, ba n> ubi, chikọta ihe n> ubi ahu n> azu ndi n=eb#i ọka: o we dabara ya ib#a n> #ok#e ubi Boaz nwere, onye sitere n> ab͕uru Elimelek. 4 Ma, le, Boaz siri na Bet-lehem bia, si ndi n=eb#i ọka, Jehova nọyere unu. Ha we si ya, Jehova gọzie gi. 5 Boaz we si nwa-okorọbia-ya nke edoro ya onye-isi ndi n=eb#i ọka, #Onye nwe nwa-ab͕ọghọ a? 6 Nwa-okorọbia ahu nke edoro onye-isi ndi n=eb#i ọka we za, si, Nwa-ab͕ọghọ Moab ka ọ bu, nke soro Naomi si n> ala-ọhia Moab lata: 7 ọ si, Biko, ka m> chikọta ihe, kpokọta kwa ihe n> etiti #ukw#u-ọka n> azu ndi n=eb#i ọka: o we bia, guzogide site na mb͕e ututu we rue ub͕u a, ma ub͕u a ọ n=anọdu n> ulo nwa mb͕e. 8 Boaz we si Rut, #I nughi, nwam? Ejela ichikọta n> ubi ọzọ, esi-kwa-la n> ebe a gabiga, ma ot/u a ka i g=arapara n> aru umu-ab͕ọghọm. 9 Ka anya-gi abua di n> ubi ebe ha neb#i ọka, i g=ejeso kwa ha n> azu: #enyeghm umu-okorọbia iwu ka ha ghara imetu gi aka? ma mb͕e akpiri kpọrọ gi nku, je n> ite miri, @nua ufọdu nime miri nke umu-okorọbia n=eseta. 10 Rut we da kpue iru-ya n> ala, kpọ isi ala, si ya, Gini mere m> hutaworo amara n> iru gi, i we matam, ebe mu onwem bu ọb#ia? 11 Boaz we za, si ya, Egosiwom nke-ọma ihe nile i meworo nne di-gi site na mb͕e ọnwu di-gi: na i rapuwo kwa nna-gi na nne-gi, na ala amuru gi, i we biakute ot#u ndi nke i n=amaghi na mb͕e gara aga. 12 Jehova kwughachi gi ọlu-gi, ka ugwọ-ọlu-gi z#u kwa ez#u site n> aka Jehova, b/u Chineke Israel, Onye i biaworo ib͕ab#a n> okpuru nk#u-Ya. 13  O si, Ka m> huta amara n> iru gi, onye-nwem; n> ihi na i kasiwom obi, na n> ihi na i gwawo nwayi n=ejere gi ozi okwu n=ab#a ya n> obi, ma mu onwem adighi ka ot#u nime ndinyom n=ejere gi ozi. 14 Boaz we si ya na mb͕e iri ihe, Biarue nso ebe a, rie ufọdu nime nri, su kwa iberibe achicha gi nime manya-vine b͕ara uka. O we nọdu n> akuku ndi n=eb#i ọka: Boaz we nye ya ọka a@nara n> ọku, ọ ta, afọ we ju ya, o we tafọ. 15 O we bilie ichikọta ọka, Boaz we nye umu-okorọbia-ya iwu, si, Obun/a n> etiti #ukw#u-ọka ka ọ g=achikọta, ma unu emela ka ihere me ya: 16  Ozọ kwa, n> ezie dọputaranu ya ufọdu nime #ukw#u-ọka, rapu ya, ka o we chikọta ya, unu aba-kwa-rala ya nba. 17 O we n=achikọta n> ubi ahu rue anyasi; o we ticha nke ọ chikọtara, ọ ra ka ot#u ephah ọka barley. 18 O bulie ya, ba n> obodo: nne di-ya we hu ihe ọ chikọtara: o weputa nye ya ihe o rifọrọ mb͕e afọ juru ya-ri. 19 Nne di-ya we si ya, #Ole ebe i chikọtaworo ọka ta? # O bu kwa ole ebe i luru ọlu? ka onye n=amata gi buru onye agọziri agọzi. O we gosi nne di-ya onye ọ luru ọlu n> ubi-ya, si, Aha nwoke ahu onye m> luru ọlu n> ubi-ya ta bu Boaz. 20 Naomi we si nwunye nwa-ya, Onye agọziri agọzi diri Jehova, ka ọ bu, Onye n=arapughi ebere O n=emere ndi di ndu na ndi nwuru anwu. Naomi we si ya, Onye-aru-ayi ka nwoke ahu bu, ot#u onye nime ndi-nb͕aputa-ayi ka ọ bu. 21 Rut, b/u nwayi Moab, we si, Ihe ọzọ ọ sirim bu, N> aru umu-okorọbia m> nwere ka i g=arapara, rue mb͕e ha b#isiri ọkam nile. 22 Naomi we si Rut, b/u nwunye nwa-ya, O di nma, nwam, ka i soro umu-ab͕ọghọ-ya pua, ka ha ghara kwa izute gi n> ubi ọzọ. 23 O we rapara n> aru umu-ab͕ọghọ Boaz ichikọta rue ọgwugwu ob#ib#i ọka barley na ob#ib#i ọka wheat; ọ we biri n> ulo nne di-ya.

Rut 3

1 Naomi, b/u nne di-ya, we si ya, Nwam, #m> gaghi-achọrọ gi izu-ike, ka o we diri gi nma? 2 Ma ub͕u a, Boaz, onye gi na umu-ab͕ọghọ-ya nọri, #ọ bughi onye ayi mara? Le, ya onwe-ya n=afucha ọka barley n> abali a n> ebe-nzọcha-ọka. 3 Sa kwa aru-gi, te manu n> aru gi, b͕okwasi uwe-nb͕okwasi-gi nile n> aru gi, ridarue ebe-nzọcha-ọka: emela ka nwoke ahu mara gi, rue mb͕e o risiri ihe, @nusi kwa ihe-ọ@nu@nu. 4 O g=eru kwa, mb͕e o dinara ala, na i g=amara ebe o n=edina, i g=ab#a kwa, kpughepu ukwu-ala-ya abua, dina ala; ya onwe-ya g=egosi kwa gi ihe i g=eme. 5 O we si ya, Ihe nile i sirim, m> g=eme ya. 6 O we ridarue ebe-nzọcha-ọka, me dika ihe nile si di nke nne di-ya nyere ya n> iwu. 7 Boaz we rie ihe, @nu kwa ihe-ọ@nu@nu, obi-ya we di nma, o we ba idina ala na nsọtu obo ọka: Rut we ba nwayọ, kpughepu ukwu-ala-ya abua, dina ala. 8 O rue, n> etiti abali, na nwoke ahu mara jijiji, we chigharia: ma, le, ot#u nwayi n=edina n> ukwu-ala-ya. 9 O we si, Onye ka i bu? O si, Mu onwem bu Rut, or#u-gi nwayi: b͕asa kwa ọnu-ọnu uwe-nwuda-gi n> aru or#u-gi nwayi; n> ihi na onye-nb͕aputa ka i bu. 10  O si, Nwayi agọziri agọzi diri Jehova ka i bu, nwam: i mewo ebere nke-ọma n> ikpe-azu kari na mbu, ebe i n=ejesoghi umu-okorọbia, ma ọ bu onye n=enweghi ike ma-ọbu ọgaranya. 11 Ma ub͕u a, nwam, atula egwu; ihe ọ bula nke i n=asi, m> g=emere gi ya: n> ihi na ọnu-uzọ-ama nile nke ndim mara na nwayi n=ejide onwe-ya nke-ọma ka i bu. 12 Ma ub͕u a, ọ bu n=ọ ezie na onye-nb͕aputa ka m> bu: ọzọ kwa, onye-nb͕aputa di nke di nso karim. 13 Nọ ọnọdu abali a, o g=eru kwa n> ututu, na ọ buru na ọ b͕aputa gi, ọ di nma; ya b͕aputa: ma ọ buru na ọ tọghi ya utọ ib͕aputa gi, mu onwem g=ab͕aputa kwa gi, Jehova n=adi ndu: dina ala rue ututu. 14 O we dina ala n> ukwu-ala-ya rue ututu: o we bilie tutu madu g=amata ibe-ya. Boaz we si, Ka aghara imara na nwayi batara n> ebe-nzọcha-ọka. 15  O si kwa, Chita /akw#a-nb͕okwasi-gi nke di n> aru gi, jide ya; o we jide ya: Boaz we t#ua ọt#ut#u ọka barley isi, bo ya: o we ba n> obodo. 16 O we biakute nne di-ya, nne di-ya we si, #Onye ka i bu, nwam? O we gosi ya ihe nile nke nwoke ahu mere ya. 17 O we si, Ot#ut#u ọka barley isi ndia ka ọ nyerem; n> ihi na ọ siri, Ab͕ala aka bakuru nne di-gi. 18  O si, Nọdu du, nwam, rue mb͕e i mara ka okwu a g=esi da: n> ihi na nwoke ahu agaghi-anọ j=u, ma ọ buru na O kwub#ighi okwu ahu ta.

Rut 4

1 Ma Boaz rigoro rue ọnu-uzọ-ama, nọdu n> ebe ahu: ma, le, onye-nb͕aputa ahu nke Boaz kwuru okwu bayere ya n=agabiga; ọ kpọ aha-ya, si, Wezuga onwe-gi, nọdu ala n> ebe a. O we wezuga onwe-ya, nọdu ala. 2 O we chiri ndikom iri sitere na ndi-okenye obodo, si, Nọdunu ala n> ebe a. Ha we nọdu ala. 3 O we si onye-nb͕aputa ahu, Naomi, nke siworo n> ala-ọhia Moab lata, n=ere #ok#e ubi ahu nke nwa-nne-ayi, b/u Elimelek, nwere: 4 ma mu onwem siri, na m> g=ekpughepu nti-gi ka i nu ya, si, Zuru ya n> iru ndi n=anọdu ebe a, na n> iru ndi-okenye ndim. O buru na i g=ab͕aputa ya, b͕aputa ya: ma ọ buru na ab͕aputaghi ya, gosim, ka m> we mara: n> ihi na ọ dighi onye ib͕aputa ya ma-ọbughi gi; ma mu onwem n=eso gi n> azu. O si, M> g=ab͕aputa ya. 5 Boaz we si, N> ubọchi i g=azuru ubi ahu n> aka Naomi, ọ bu kwa n> aka Rut, b/u nwayi Moab, b/u nwunye onye nwuru anwu, ka i g=azuru ya, ime ka aha onye nwuru anwu bilie n> elu ihe-nketa-ya. 6 Onye-nb͕aputa ahu we si, apughi m ib͕aputara ya onwem, ka m> we ghara ibibi ihe-nketam: gi onwe-gi b͕aputara onwe-gi ihe-nb͕aputam; n> ihi na apughm ib͕aputa ya. 7 Ma nka bu ihe an=eme na mb͕e gara aga n> Israel bayere ihe-nb͕aputa, baye-kwa-ra ihe-nb͕anwe, ime ihe ọ bula ka o guzosie ike: nwoke b͕upuru akpukpọ-ukwu-ya, nye ya madu-ibe-ya: nka bu kwa ihe-#am#a n> Israel. 8 Onye-nb͕aputa ahu we si Boaz, Zuru ya n> onwe-gi. O we b͕upu akpukpọ-ukwu-ya. 9 Boaz we si ndi-okenye ahu na ndi ahu nile, Ndi-#am#a ka unu bu ta, na azuruwom ihe nile nke Elimelek nwere, na ihe nile nke Kilion na Mahlon nwere, n> aka Naomi. 10  Ozọ kwa, Rut, b/u nwayi Moab, b/u nwunye Mahlon, ka m> zuruwo-kwa-ra ibu nwunyem, ime ka aha onye nwuru anwu bilie n> elu ihe-nketa-ya, ka aghara kwa ibipu aha onye nwuru anwu n> etiti umu-nne-ya, na n> ọnu-uzọ-ama ebe nke ya: ndi-#am#a ka unu bu ta. 11 Ndi nile ndi nọ n> ọnu-uzọ-ama na ndi-okenye we si, Ndi-#am#a ka ayi bu. Jehova me nwayi a nke n=ab#a n> ulo-gi ka ọ di ka Rechel na dika Lea, ndi ha abua wuru ulo Israel: gi me kwa d#inkp#a n> Efrata, me ka amara aha-gi na Bet-lehem: 12 ka ulo-gi di kwa ka ulo Perez, onye Tema muru nye Juda, site na nkpuru nke Jehova g=enye gi site na nwa-ab͕ọghọ a. 13 Boaz we kuru Rut, o we ghọrọ ya nwunye; o we bakuru ya, Jehova we me ka ọ turu ime, ọ mua nwa-nwoke. 14 Ndinyom we si Naomi, Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, Onye n=emeghi ka onye-nb͕aputa kwusiri gi ta, ka akpọ kwa aha-ya n> Israel. 15  O g=abu-kwa-ra gi onye n=enyeghachi ndu, na onye g=az#u gi n> isi-awọ: n> ihi na nwunye nwa-gi, nke huru gi n> anya, nke diri gi nma kari umu-ndikom asa, amuwo ya. 16 Naomi we kuru nwata ahu, tukwasi ya n> obi-ya, ghọrọ ya onye n=az#u nwa. 17 Ndinyom, b/u ndi-ab͕ata-obi-ya, we kpọ ya aha, si, Amuru nwa-nwoke nye Naomi; ha we kpọ aha-ya Obed: onye ahu bu nna Jesi, nna Devid. 18 Ma ndia bu osuso-ọmumu Perez: Perez muru Hezron; 19 Hezron we mua Ram, Ram we mua Aminadab; 20 Aminadab we mua Nahshon, Nahshon we mua Salmon; 21 Salmon we mua Boaz, Boaz we mua Obed; 22 Obed we mua Jesi, Jesi we mua Devid.

1 Samuel 1

1 Ma otù nwoke nke Ramataim-zofim, nke ugwu Efraim, di, aha-ya bu Elkena, nwa Jeroham, nwa Elaihu, nwa Tohu, nwa Zuf, onye Efrata: 2 o nwekwara ndinyom abua; aha otù bu Hana, aha nke ibe-ya bu Penina: Penina nwere umu, ma Hana enweghi umu. 3 Nwoke a we si n'obodo-ya nārigo kwa-arọ ikpọ isi ala na ichuru Jehova nke usu nile nke ndi-agha àjà n'ime Shailo. Ọ bu kwa n'ebe ahu ka umu-ndikom Ilai abua, bú Họfnai na Finehas, ndi-nchu-àjà Jehova, nọ. 4 Ubọchi ahu wee rue, Elkena we chua àjà, nye Penina nwunye-ya òkè ufọdu, nye kwa umu-ya ndikom na umu-ya ndinyom nile: 5 ma o nyere Hana òkè madu abua: n'ihi na ọ bu Hana ka ọ huru n'anya, ma Jehova mechiri àkpà-nwa-ya. 6 Onye-nkpab͕u-ya we kpasue ya iwe nke-uku, imekpa ya aru, n'ihi na Jehova mechiri àkpà-nwa-ya. 7 Ọ bu kwa otú a ka Elkena nēme kwa-arọ, mb͕e ọ bula Hana rigoro n'ulo Jehova, otú a ka Penina nākpasu ya iwe; o we kwa ákwá, ghara iri ihe. 8 Elkena, bú di-ya, we si ya, Hana, n'ìhi gini ka i nākwa ákwá? ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka i nērighi ihe? ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka obi-gi jọrọ njọ? mù onwem adighi nma n'ebe i nọ kari umu-ndikom iri? 9 Hana we bilie mb͕e ha risiri ihe nime Shailo, mb͕e ha ṅusikwara ihe-ọṅuṅu. Ma Ilai, bú onye-nchu-àjà, nānọkwasi n'oche-ya n'akuku awara-uzọ ulo uku Jehova. 10 O we di Hana ilu na nkpuru-obi, o we kpere Jehova, kwasie ákwá ike. 11 Ọ we kwe nkwa, si, Jehova nke usu nile nke ndi-agha, ọ buru na I lekwasi anya n'ezie na nweda-n'ala nke orù-Gi nwayi, ọ buru na I chetam, ghara ichezọ orù-Gi nwayi, we nye orù-Gi nwayi nwa-nwoke, m'gēnye kwa ya Jehova ubọchi ndu-ya nile, aguba agaghi-aga kwa n'elu isi-ya. 12 O rue, mb͕e o kpere ọtutu ekpere n'iru Jehova, na Ilai nāriba ọnu-ya ama. 13 Ma Hana, ya onwe-ya nēkwu okwu n'obi-ya; nání egbugbere-ọnu-ya nēme úkpọ̀rọ́, ma anughi olu-ya: Ilai we chè na ọ ṅubigara manya ókè. 14 Ilai we si ya, Rùe ole mb͕e ka i ganāṅubiga manya ókè? wezuga manya-vine-gi n'aru gi. 15 Hana we za, si, É-è, onye-nwem, nwayi nke mọ-ya di arọ́ ka m'bu: ọ dighi manya-vine ma-ọbu ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya m'ṅuworo, kama awusirim nkpuru-obim n'iru Jehova. 16 Agula orù-gi nwayi na nwayi jọb͕uru onwe-ya: n'ihi na ọ bu n'ọtutu ntughari-uchem na nkpasu-iwem ka m'siteworo kwue okwu rue ub͕u a. 17 Ilai we za, si, La n'udo: Chineke Israel nye kwa gi aririọ-gi nke i riọworo n'aka-Ya. 18 Hana we si, Ka nwayi nke nējere gi ozi huta amara n'iru gi. Nwayi ahu we je ije-ya, rie ihe, iru-ya ab͕arughi kwa n'ihi ya ọzọ. 19 Ha we bilie n'isi-ututu, kpọ isi ala n'iru Jehova, we lata, ba n'ulo-ha, rue Rema: Elkena we mara aru Hana nwunye-ya; Jehova we cheta ya. 20 O rue, n'ọb͕ub͕a arọ, na Hana turu ime, mua nwa-nwoke; o we kpọ aha-ya Samuel, si, N'ihi na ọ bu n'aka Jehova ka m'riọworo ya. 21 Nwoke ahu, bú Elkena, na ulo-ya nile we rigo ichuru Jehova aja arọ, na nkwa-ya. 22 Ma Hana arigoghi; n'ihi na ọ siri di-ya, rue mb͕e agēme ka nwata rapu ara, m'gēme kwa ka ọ bia, ka ewe hu ya anya n'iru Jehova, o we biri n'ebe ahu rue mb͕e ebighi-ebi. 23 Elkena, bú di-ya, we si ya, Me ihe di nma n'anya-gi; nọdu rue mb͕e i meworo ka ọ rapu ara; nání ka Jehova me ka okwu-Ya guzosie ike. Nwayi ahu we nọdu, nye nwa-ya ara, rue mb͕e o mere ka ọ rapu ara. 24 Ma mb͕e o mere ka ọ rapu ara, o we kuru ya n'aka-ya rigo, chiri kwa oke-ehi atọ, na otù ephah utu ọka, na otù karama-akpukpọ manya-vine, we me ka ọ ba n'ulo Jehova na Shailo: nwata ahu bu nání nwata. 25 Ha we b͕ue oke-ehi ahu, we me ka nwata ahu biakwute Ilai. 26 Hana we si, Biko, onyenwe m, nkpuru-obi-gi nādi ndu, onyenwe m, Mu onwem bu nwayi ahu nke guzoro onwe-ya nso gi n'ebe a, ikpere Jehova. 27 Ekpere bayere nwata nka ka m'kpere; Jehova we nyem aririọm nke m'riọrọ n'aka-Ya: 28 ọzọ kwa, mu onwem emewo ka ariọtara ya Jehova; ubọchi nile ọ nādi ndu ya onwe-ya bu onye ariọtaworo nye Jehova. Ilai we kpọ isi ala nye Jehova n'ebe ahu.

1 Samuel 2

1 Hana we kpe ekpere, si: Ọ nātọ obi m utọ n'ime Jehova, Mpim adiwo elu n'ime Jehova: Ọnum asawo mbara n'elu ndi-irom, N'ihi na aṅuriwom ọṅu na nzọputa-Gi. 2 Ọ dighi onye di nsọ dika Jehova; N'ihi na ọ dighi onye ọzọ ma-ọbughi Gi: Ọ dighi kwa oké nkume ọ bula dika Chineke-ayi. 3 Unu ekwula ọtutu okwu di elu elu; Ka oké okwu ghara isi n'ọnu-unu puta: N'ihi na Chineke nke ọmuma-ihe ka Jehova bu, Anēsite kwa n'aka-Ya atù omume. 4 Anyajiwo uta ndi-dike, Ma ndi nāsu ngọngọ ewerewo ike ke onwe-ha dika ihe-ọkiké. 5 Ndi afọ juru emewo onwe-ha ndi egoro ọlu n'ihi nri; Ma agu agubìwo ndi ọ nāgu: Ebe nwanyi àgà muworo umu asa; Ma nwanyi nke nwere ọtutu umu atawo aru. 6 Jehova nēme ka anwua, Ọ nēme kwa ka adi ndu: Ọ nēme ka arida rue ala-mọ, Ọ nēme kwa ka arigota. 7 Jehova nānapu madu ihe, nēme kwa ka ọ buru ọgaranya: Ọ nēme ka adi ala, Ọ nēme kwa ka adi elu. 8 Ọ nēme ka onye nēnweghi ike si n'ájá bilie, Ọ nēsi n'ebe-ikpofu-ahihia welie ob͕eye elu, Ime ka ha na ndi-isi nọdu, Na ime ka ha keta oche-eze nsọpuru: N'ihi na Jehova nwe ogidi nile nke uwa, O dowo kwa elu-uwa dum madu bi n'elu ha. 9 Ukwu ndi-ebere-Ya ka Ọ nēdebe, Ma agēme ka ndi nēmebi iwu-Ya debe ọnu-ha dū n'ọchichiri; N'ihi na ọ bughi ike ka madu gēji kari n'ike. 10 Agētipia ndi nāchọ Jehova okwu; Ọ gāmakwasi ha éb͕è-elu-igwe n'elu-igwe: Jehova gēkpe nsọtu nile nke uwa ikpe; Ọ gēnye kwa eze-Ya ike, Me kwa mpi onye-Ya etere manu ka ọ di elu. 11 Elkena we la Rema rue ulo-ya. Nwata ahu we nējere Jehova ozi n'iru Ilai, bú onye-nchu-àjà. 12 Ma umu-ndikom Ilai bu ndi jọb͕uru onwe-ha; ha amaghi Jehova. 13 Ikpe ekpere banyere ndi-nchu-àjà n'ebe ndi Israel nọ bu nka, mb͕e nwoke ọ bula nāchu àjà, nwa-okorọbia nke onye-nchu-àjà we bata, mb͕e anēsi anu, nduri nke wara ezé atọ di n'aka-ya; 14 o we dubà ya n'ite ọku, ma-ọbu n'ite isi miri, ma-ọbu n'ite isi anu, ma-ọbu n'ite ọzọ; ihe ọ bula ndudu ahu dulitere ka onye-nchu-àjà nēwere na ya. Otú a ka ha nēme Israel nile n'ime Shailo, bú ndi nābia n'ebe ahu. 15 Ọzọ, tutu ha esure abuba ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, nwa-okorọbia nke onye-nchu-àjà biara, si nwoke ahu nke nāchu àjà, Nye anu iruru onye-nchu-àjà; ọ gaghi-anara kwa anu esiri esi n'aka-gi, kama anu ndu. 16 Ma ọ buru na nwoke ahu asi ya, Ha aghaghi isure abuba ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ dika anēme ta, emesia nara n'onwe-gi dika nkpuru-obi-gi si achọ; ọ gāsi kwa, É-è, kama ub͕u a ka i gēnyem: ma ọ buru na i nyeghm, m'gānara ya n'ike. 17 Nmehie umu-okorọbia ahu we di ukwu ri nne n'iru Jehova: n'ihi na ndikom ahu nēleli-onyinye-inata-iru-ọma nke Jehova. 18 Ma Samuel nēje ozi n'iru Jehova, buru nwata, ewerewo kwa ephod nke ákwà ọcha ke ya dika ihe-ọkiké. 19 Nne-ya we mere ya uwe-nwuda ntà, chigoro ya kwa-arọ, mb͕e o soro di-ya rigo ichu àjà arọ. 20 Ilai we gọzie Elkena na nwunye-ya, si, Jehova doro gi nkpuru site na nwayi a n'ọnọdu ihe-nriọta ariọtara Jehova. Ha we la n'ebe-ha. 21 N'ihi na Jehova letara Hana, o we turu ime, mua umu-ndikom atọ na umu-ndinyom abua. Nwata ahu, bú Samuel, we nētó n'ulo Jehova. 22 Ma Ilai emewo agadi nke-uku; o we nu ihe nile umu-ya ndikom nēme Israel nile, na otú ha nēso ndinyom ahu dina, bú ndi nēzukọ n'usu n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute. 23 O we si ha, N'ìhi gini ka unu nēme ihe dika ihe ndia? n'ihi na mu onwem nānu ihe ọjọ nile unu n'ọnu ndi nka nile. 24 É-è, umum; n'ihi na ọ dighi nma, bú akukọ nke mu onwem nānu: unu nēme ka ndi Jehova jehie. 25 Ọ buru na madu emehie megide madu, Chineke gēkpe kwa ya ikpe: ma ọ buru na ọ bu Jehova ka madu nēmehie megide, ònye gēkpere Jehova ekpere bayere ya? Ma ha egeghi nti olu nna-ha, n'ihi na ọ tọrọ Jehova utọ ime ka ha nwua 26 Nwa-okoro ahu, bú Samuel, we nētó nāga n'iru, o we di nma, ma n'ebe Jehova nọ, ma n'ebe madu nọ. 27 Onye nke Chineke we biakwute Ilai, si ya, Otú a ka Jehova siri, Èkpugherem onwem n'ezie nye ulo nna-gi, mb͕e ha nọ n'Ijipt buru orù nye ulo Fero? 28 Èsim n'ebo nile nke Israel rọputa ya iburum onye-nchu-àjà, irigo rue ebe-ichu-àjàm, isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, iyiri ephod n'irum? ènye-kwa-ram ulo nna-gi àjà-ọku nile nke umu Israel? 29 N'ìhi gini ka unu nāzọkwasi àjàm ukwu, zọkwasi kwa onyinye-inata-iru-ọmam, nke M'nyeworo n'iwu n'ebe-obibim; i we nāsọpuru umu-gi ndikom karim, ime onwe-unu ka unu ma abuba site n'ihe kachasi nma nke onyinye-inata-iru-ọma ọ bula nke Israel, bú ndim? 30 N'ihi nka, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova, bú Chineke Israel, puta, Ọ bu ezie na M'siri na ulo-gi na ulo nna-gi gējeghari n'irum rue mb͕e ebighi-ebi: ma ub͕u a, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, Ya burum ihe-árú; n'ihi na ndi nāsọpurum ka M'gāsọpuru, ma agākpọ ha ihe efu, bú ndi nēlelìm. 31 Le, ubọchi nābia, na M'gēbipu ogwe-aka-gi na ogwe-aka ulo nna-gi, na agadi agaghi-adi n'ulo-gi. 32 I gēlegide kwa onye-nkpab͕u n'ebe-obibim, n'ezi ihe nile nke Chineke gēmere Israel: agadi agaghi-adi kwa n'ulo-gi ubọchi nile. 33 Ma nwoke nke diri gi, nke M'nāgaghi-ebipu n'ebe-ichu-àjàm, gābu ime ka anya-gi abua hubìe uzọ, na imekpa nkpuru-obi-gi aru: ọmùmù nile nke ulo-gi gānwu tutu ha erue agadi. 34 Nka gābu-kwa-ra gi ihe-iriba-ama, nke gābiakwasi umu-gi abua, bú Họfnai na Finehas; n'otù ubọchi ka ha abua gānwu. 35 Ma M'gēme ka onye-nchu-àjà nke kwesiri ntukwasi-obi bilierem, ọ bu dika ihe si di nke di nime obim na nime nkpuru-obim ka ọ gēme: M'gēwu-kwa-ra ya ulo kwesiri ntukwasi-obi, ọ gējeghari kwa n'iru onye nkem etere manu ubọchi nile. 36 Ọ gēru kwa, na onye ọ bula nke fọduru n'ulo-gi gābia ikpọ isi ala nye ya n'ihi ego ntà nke ọla-ọcha na ob͕e achicha, ọ gāsi kwa, Biko, tiyem n'otù uzọ ọlu-nchu-àjà, ka m'we rie iberibe achicha.

1 Samuel 3

1 Nwata ahu, bú Samuel, we nējere Jehova ozi n'iru Ilai. Okwu Jehova we di oké ọnu na mb͕e ahu; ọ dighi ọhù ekwusara. 2 O rue, n'ubọchi ahu, mb͕e Ilai nēdina ala n'ebe-ya, (ma anya-ya malitere ihu inyoghi-inyoghi, na ọ pughi ihu uzọ, ) 3 mb͕e oriọna Chineke akānyughi anyu, mb͕e Samuel nēdina ala n'ulo ukwu Jehova, ebe ib͕e Chineke di; 4 na Jehova kpọrọ Samuel òkù: o we si, Lem. 5 O we b͕akuru Ilai, si, Lem; n'ihi na i kpọrọm òkù. Ọ si, Akpọghm òkù; jeghachi dina ala. O we je dina ala. 6 Jehova we kpọ kwa òkù ọzọ, si, Samuel. Samuel we bilie jekuru Ilai, si, Lem; n'ihi na i kpọrọm òkù. Ọ si, Akpọghm òkù, nwam; jeghachi dina ala. 7 Ma Samuel akāmaghi Jehova, akēkpugheghi kwa okwu Jehova nye ya. 8 Jehova we kpọ Samuel òkù ọzọ nke ub͕ò atọ. O we bilie, jekuru Ilai, si, Lem; n'ihi na i kpọrọm òkù. Ilai we ghọta na Jehova nākpọ nwa-okoro ahu òkù. 9 Ilai we si Samuel, Je, dina ala: ọ gēru kwa, ọ buru na Ọ kpọ gi òkù, na i gāsi, Kwue, Jehova; n'ihi na orù-Gi nānu. Samuel we je, dina ala n'ebe-ya. 10 Jehova we bia, guzo Onwe-ya, kpọ òkù dika Ọ kpọrọ ub͕ò nile, si, Samuel, Samuel. Samuel we si, Kwue; n'ihi na orù-Gi nānu. 11 Jehova we si Samuel, Le, Mu onwem nēme ihe n'Israel, nke nti abua nke onye ọ bula nānu ya gāzu wuruwuru. 12 N'ubọchi ahu M'gēme ka okwu nile M'kwuworo banyere ulo-ya guzosie ike megide Ilai, site na nmalite we rue ọgwugwu. 13 Egosiwokwam ya na Mu onwem nēkpe ulo-ya ikpe rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi ajọ omume nke ọ mara, n'ihi na umu-ya ndikom nēwetara onwe-ha nkọcha, ma o b͕ochighi ha. 14 N'ihi ya M'we ṅuara ulo Ilai iyi, na agaghi-ewere àjà ma-ọbu onyinye-inata-iru-ọma kpuchie ajọ omume ulo Ilai rue mb͕e ebighi-ebi. 15 Samuel we dina ala rue ututu, we meghepu ọnu-uzọ ulo Jehova. Ma Samuel turu egwu igosi Ilai ọhù ahu. 16 Ilai we kpọ Samuel, si, Samuel, nwam. O we si, Lem. 17 Ọ si, Gini bu okwu ahu nke Ọ gwara gi? biko, ezonarilam ya: Chineke me gi otú a, me kwa gi ihe ọzọ otú a, ọ buru na i zonarim okwu ọ bula sitere n'okwu nile nke Ọ gwara gi. 18 Samuel we gosi ya okwu ahu nile, ọ dighi kwa ihe o zonariri ya. O we si, Jehova ka ọ bu: Ya me ihe di nma n'anya-Ya. 19 Samuel we tó, Jehova nọye-kwa-ra ya, Ọ kweghi kwa ka okwu da n'ala sitere n'okwu-ya nile. 20 Israel nile site na Dan we rue Bia-sheba we mara na emewo Samuel onye kwesiri okwukwe iburu Jehova onye-amuma. 21 Jehova we me ka ahú kwa ya anya ọzọ nime Shailo: n'ihi na Jehova kpughere Onwe-ya nye Samuel nime Shailo n'okwu Jehova.

1 Samuel 4

1 Okwu Samuel we rue Israel nile nti. Israel we pua izute ndi Filistia ibu agha, we ma ulo-ikwū-ha n'akuku Eben-eza: ndi Filistia we ma ulo-ikwū-ha n'Efek. 2 Ndi Filistia we do onwe-ha n'usoro izute Israel: agha ahu we nọsa, ewe tib͕ue Israel n'iru ndi Filistia: ha we tib͕ue n'etiti usoro ndi-agha Israel n'ọhia ihe ra ka nnù ndikom iri. 3 Ndi Israel we ba n'ọmuma-ulo-ikwū, ndi-okenye Israel we si, N'ìhi gini ka Jehova tib͕uworo ayi ta n'iru ndi Filistia? Ka ayi si na Shailo wetara onwe-ayi ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, ka o we bata n'etiti ayi, zọputa ayi n'ọbu-aka ndi-iro-ayi. 4 Ndi Israel we ziga na Shailo, ha we si n'ebe ahu bute ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Onye bi n'etiti cherubim: umu-ndikom Ilai abua, bú Họfnai na Finehas, nọye-kwa-ra ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Chineke n'ebe ahu. 5 O rue, mb͕e ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova batara n'ọmuma-ulo-ikwū, na Israel nile tiri oké nkpu, ala wee daa uda. 6 Ndi Filistia we nu olu iti-nkpu ahu, we si, Gini bu olu oké iti-nkpu a n'ọmuma-ulo-ikwū ndi-Hibru? Ha we mara na ib͕e Jehova abàwo n'ọmuma-ulo-ikwū. 7 Ndi Filistia we tua egwu, n'ihi na ha siri, Chineke abàwo n'ọmuma-ulo-ikwū ahu. Ha we si, Ahuhu nādiri ayi! n'ihi na ihe dika nka adighi na mb͕e gara aga. 8 Ahuhu nādiri ayi! ònye gānaputa ayi n'aka chi ndia di ike nke-ukwu? ndia bu chi nke were ihe-otiti nile ọ bula tib͕ue ndi Ijipt n'ọzara. 9 Menu onwe-unu ka unu di ike, buru-kwa-nu ndikom, unu ndi Filistia, ka unu ghara iburu ndi-Hibru ndi-orù, dika ha buruworo unu ndi-orù: burunu ndikom, bu-kwa-nu agha. 10 Ndi Filistia we bu agha, ewe tib͕ue Israel, ha we b͕alaga, nwoke ọ bula n'ulo-ikwū-ya: oké ntib͕u uku we di; orú nnù ndikom uzọ atọ na nnù iri-na-ise, bú ndi ji ukwu eje, we dapu n'Israel. 11 Ewe were ib͕e Chineke; umu-ndikom Ilai abua, bú Họfnai na Finehas, nwukwara. 12 Otù nwoke onye Benjamin we si n'usoro agha ahu b͕a ọsọ, biarue Shailo n'ubọchi ahu, uwe nwuda ya nile dọwara adọwa, ájá dikwasi ya n'isi. 13 Ọ we bia, ma, le, Ilai nānọkwasi n'oche-ya n'akuku uzọ, nēche nche: n'ihi na obi-ya nāma jijiji n'ihi ib͕e Chineke. Nwoke ahu we ba igosi ya n'obodo, obodo ahu nile we tie nkpu. 14 Ilai we nu olu iti-nkpu ahu, si, Gini bu olu ùzù a? Nwoke ahu we me ngwa bata, gosi Ilai. 15 Ma Ilai b͕ara ọgu arọ anọ na iri na asatọ; anya-ya abua guzoro eguzo, ọ pughi kwa ihu uzọ. 16 Nwoke ahu we si Ilai, Mu onwem bu onye si n'usoro agha bia, mu onwem si kwa n'usoro agha b͕alaga ta. O we si, Gini bu ihe emere, nwam? 17 Onye ahu nke nēzì ozi ahu we za, si, Israel ab͕alagawo n'iru ndi Filistia, ọzọ kwa, oké ntib͕u adiwo n'etiti ndi Israel, ọzọ kwa, umu-gi ndikom abua, bú Họfnai na Finehas, anwuwo, ewerewo kwa ib͕e Chineke. 18 O rue, mb͕e o hotara ib͕e Chineke, na o si n'oche-ya dala azu n'akuku ọnu-uzọ-ama, olu-ya we b͕ajie, o we nwua: n'ihi na nwoke ahu bu agadi, di kwa arọ́. Ya onwe-ya kpe-kwa-ra Israel ikpe ọgu arọ abua. 19 Nwunye nwa-ya, bú nwunye Finehas, di ime, ọ gaje imu nwa: o we nu akukọ ahu na ewerewo ib͕e Chineke, na nna di-ya na di-ya anwuwo, o we ruru ala mua nwa; n'ihi na ime mere ya na mberede. 20 Ma na mb͕e ọnwu-ya ndinyom ndi nēguzo n'akuku ya we kwue, si, Atula egwu; n'ihi na nwoke ka i muworo. Ma ọ zaghi, ọ tukwasighi kwa obi-ya na ya. 21 O we kpọ aha nwa ahu Ikabod, si, Nsọpuru esiwo n'Israel pua: n'ihi owuwe ewere ib͕e Chineke, na n'ihi nna di-ya na di-ya. 22 O we si, Nsọpuru esiwo n'Israel pua; n'ihi na ewerewo ib͕e Chineke.

1 Samuel 5

1 Ma ndi Filistia were ib͕e Chineke, ha we si n'Eben-eza bubata ya n'Ashdod. 2 Ndi Filistia we were ib͕e Chineke, bubata ya n'ulo Degon, dọba ya n'akuku Degon. 3 Ndi Ashdod we bilie n'isi-ututu n'echi-ya, ma, le, Degon adakpuwo iru-ya n'ala n'iru ib͕e Jehova. Ha we were Degon, tiyeghachi ya n'ọnọdu-ya. 4 Ha we bilie n'isi-ututu n'echi-ya, ma, le, Degon adakpuwo iru-ya n'ala n'iru ib͕e Jehova; ma ebipuwo isi Degon na ọbu-aka-ya abua, ha we tọb͕ọrọ na nbata-uzọ; nání akuku-ya nke bu azù fọduru ya. 5 N'ihi ya ndi-nchu-aja Degon na ndi nile nke nābà n'ulo Degon adighi-azọkwasi ukwu na nbata-uzọ Degon n'Ashdod, rue ta. 6 Aka Jehova we di arọ́ n'aru ndi Ashdod, Ọ we kpochapu ha, were kwa emerod tib͕ue ha, bú Ashdod na ókè-ala-ya nile. 7 Ndikom Ashdod we hu na ọ di otú a, ha we si, Ib͕e Chineke Israel agaghi-anọgide n'etiti ayi: n'ihi na aka-Ya esikawo ike n'aru ayi na n'aru Degon, bú chi-ayi. 8 Ha we ziga, chikọtara onwe-ha ndi-isi nile nke ndi Filistia, si, Gini ka ayi gēme ib͕e Chineke Israel? Ha we si, Ka eburu ib͕e Chineke Israel b͕a buruburu rue Gat. Ha we būru ib͕e Chineke Israel b͕a buruburu rue ebe ahu. 9 O rue, mb͕e ha būsiri ya buruburu, na aka Jehova digidere obodo ahu n'ọb͕ub͕a-aghara di uku ri nne: Ọ we tib͕ue ndikom obodo ahu, site n'onye ntà we rue onye uku, emerod we b͕apue n'aru ha. 10 Ha we ziga ib͕e Chineke rue Ekron. O rue, mb͕e ib͕e Chineke biaruru Ekron, na ndi Ekron tiri nkpu, si, Ha eburuwo ib͕e Chineke Israel b͕a buruburu biakute ayi, ime ka ayi na ndi-ayi nwua. 11 Ha we ziga, chikọta ndi-isi nile nke ndi Filistia, si, Zilaga ib͕e Chineke Israel, ka ọ laghachi kwa n'ebe-ya, ka o we ghara ime ka ayi na ndi-ayi nwua: n'ihi na ọb͕ub͕a-aghara nke ọnwu di n'obodo ahu nile; ọ di arọ́ nke-uku, bú aka Chineke, n'ebe ahu. 12 Ndikom kwa ndi nānwughi, ewere emerod tib͕ue ha: ntiku obodo ahu we rigorue elu-igwe.

1 Samuel 6

1 Ib͕e Jehova we di n'ọhia ndi Filistia ọnwa asa. 2 Ndi Filistia we kpọ ndi-nchu-aja na ndi nāju ase, si, Gini ka ayi gēme ib͕e Jehova? me ka ayi mara ihe ayi gēji zilaga ya n'ebe-ya. 3 Ha we si, Ọ buru na unu ezilaga ib͕e Chineke Israel, ezilagala ya n'aka efu; kama unu aghaghi inyeghachi Ya àjà-ikpe-ọmuma: mb͕e ahu agēme ka aru-unu di ike, agēme kwa ka unu mara ihe mere anēwezugaghi aka-Ya n'aru unu. 4 Ha we si, Gini gābu àjà-ikpe-ọmuma ahu nke ayi gēnyeghachi Ya? Ha we si, Dika ọnu-ọgugu ndi-isi ndi Filistia si di, ọ bu emerod ọla-edo ise na òké ọla-edo ise ka unu gēnyeghachi: n'ihi na otù ihe-otiti diri ha nile, di-kwa-ra ndi-isi-unu. 5 Unu gēme kwa onyinyo emerod-unu, na onyinyo òké-unu nke nēbibi ala-unu; unu gēnye kwa Chineke Israel nsọpuru: eleghi anya Ọ gēme ka aka-Ya di nfé pua n'aru unu, na n'aru chi nile unu, na n'ala-unu. 6 N'ìhi gini kwa ka unu nēme ka obi-unu di arọ́, dika ndi Ijipt na Fero mere ka obi-ha di arọ́? mb͕e Ọ kwara ha emò, hà ezilagaghi ha, ha we la? 7 Ma ub͕u a, werenu ihe me otù ub͕ọ-ala ọhu, chiri kwa nne-ehi abua nke nēnye umu ara, nke ọ dighi mb͕e yoke rigokwasiri ha, kegide-kwa-nu ehi ahu n'ub͕ọ-ala, me ka umu-ha si n'iso ha n'azu lata n'ulo: 8 were-kwa-nu ib͕e Jehova tiyekwasi ya n'ub͕ọ-ala ahu; tiye ihe ọla-edo ahu, nke unu nēnyeghachi Ya ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma, n'ib͕e ntà n'akuku-ya; zilaga-kwa-nu ya, ka ọ we la. 9 Le-kwa-nu, ọ buru na ọ rigo n'uzọ ókè-ala-ya rue Bet-shemesh, Ya onwe-ya emewo ayi oké ihe ọjọ a: ma ọ buru na ọ rigoghi otú a, ayi gāma kwa na ọ bughi aka-Ya tib͕uru ayi; ihe-ndabà ka ihe ahu bu, nke dabara ayi. 10 Ndikom ahu we me otú a; ha chiri nne-ehi abua nke nēnye umu ara, kegide ha n'ub͕ọ-ala ahu, mechibido umu-ha uzọ n'ulo: 11 ha we tukwasi ib͕e Jehova n'ub͕ọ-ala ahu, na ib͕e ntà ahu, na òké ọla-edo, na onyinyo emerod-ha. 12 Ehi ahu we jezie ejezi n'uzọ rue uzọ Bet-shemesh: ọ bu n'otù uzọ atuliri atuli ka ha jere, nēje nēti nkpu, ha ewezugaghi kwa onwe-ha n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe; ndi-isi ndi Filistia we nējeso ha n'uzọ rue ókè-ala Bet-shemesh. 13 Ma ndi Bet-shemesh nēbì ọka wheat-ha na ndagwurugwu: ha we welie anya-ha, hu ib͕e ahu, ṅuria ọṅu ihu ya. 14 Ub͕ọ-ala ahu we ba n'ubi Joshua, bú onye Bet-shemesh, guzo n'ebe ahu, nkume uku di kwa n'ebe ahu: ha we kpọwa osisi ub͕ọ-ala ahu, sure ehi abua ahu ọku ibu àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova. 15 Ndi Livai we buda ib͕e Jehova na ib͕e ntà nke di n'akuku ya, nke ihe ọla-edo ahu nile di nime ya, ha we tukwasi ha na nkume uku ahu: ndikom Bet-shemesh we sure àjà-nsure-ọku, chu-kwa-ra Jehova aja ọzọ, n'ubọchi ahu. 16 Ndi-isi ise nke ndi Filistia we hu ya, laghachi rue Ekron n'ubọchi ahu. 17 Ndia bu emerod ọla-edo nke ndi Filistia nyeghachiri, ibu àjà-ikpe-ọmuma ichuru Jehova; Ashdod nwere otù, Geza nwere otù, Ashkelon nwere otù, Gat nwere otù, Ekron nwere otù; 18 òké ọla-edo kwa, dika ọnu-ọgugu obodo nile nke ndi Filistia si di, bú nke ndi-isi ise ahu nwere, site n'obodo ewusiri ike we rue obodo ntà nke nēnweghi mb͕idi: we rue nkume uku ahu, bú Ebel, nke ha dọbara ib͕e Jehova n'elu ya: ọ di n'ubi Joshua, bú onye Bet-shemesh, rue ta. 19 O we tib͕ue ufọdu nime ndikom Bet-shemesh, n'ihi na ha lere anya nime ib͕e Jehova, O we tib͕ue n'etiti ndi Israel ọgu ndikom atọ na iri, orú nnù ndikom uzọ isi na nnù ise: ndi Israel we rue újú, n'ihi na Jehova tib͕uru ntib͕u uku n'etiti ndi Israel. 20 Ndikom Bet-shemesh we si, Ònye puru iguzo n'iru Jehova, bú Chineke nsọ a? Ọ̀ bu kwa onye ka O gēsi n'ebe ayi nọ rigokuru? 21 Ha we zigara ndi bi na Kiriat-jearim ndi-ozi, si, Ndi Filistia ebughachiwo ib͕e Jehova; ridatanu, bugo ya n'ebe unu nọ.

1 Samuel 7

1 Ndikom Kiriat-jearim we bia, bugo ib͕e Jehova, bubata ya n'ulo Abinadab n'ugwu ntà ya, do Eleeza nwa-ya nwoke nsọ idebe ib͕e Jehova. 2 O rue, site n'ubọchi ib͕e ahu nọduru na Kiriat-jearim, na ubọchi bara uba; o we di orú arọ: ulo Israel nile we kwaso Jehova. 3 Samuel we gwa ulo Israel nile okwu, si, Ọ buru na obi-unu nile ka unu onwe-unu nēwere laghachikute Jehova, wezuganu chi nile nke ndi ala ọzọ na Ashtarot n'etiti unu, dozie obi-unu ibiakute Jehova, fè-kwa-nu nání Ya òfùfè: Ọ gānaputa kwa unu n'aka ndi Filistia. 4 Umu Israel we wezuga Bealim na Ashtarot, fè nání Jehova òfùfè. 5 Samuel we si, Chikọtanu Israel nile rue Mizpa, m'gēkpe-kwa-ra Jehova ekpere bayere unu. 6 Ha we chikọta onwe-ha rue Mizpa, sere miri, wusi ya n'iru Jehova, bue ọnu n'ubọchi ahu, kwue n'ebe ahu, si, Ayi emehiewo megide Jehova. Samuel we kpe umu Israel ikpe na Mizpa. 7 Ndi Filistia we nu na umu Israel chikọtara onwe-ha na Mizpa, ndi-isi ndi Filistia we rigo imegide Israel. Umu Israel we nu ya, tua egwu ndi Filistia. 8 Umu Israel we si Samuel, Ab͕ala nkiti bayere ayi n'itiku Jehova, bú Chineke-ayi, nkpu, ka O we zọputa ayi n'aka ndi Filistia. 9 Samuel we were otù nwa-aturu nke nāṅu ara, o we sure ya ọku ka ọ buru àjà-nsuresi-ọku anēsurere Jehova: Samuel we tikue Jehova nkpu bayere Israel; Jehova we za ya. 10 O rue, mb͕e Samuel nēsure àjà-nsure-ọku ahu, na ndi Filistia biaruru nso ibuso Israel agha: Jehova we were oké olu makwasi ndi Filistia éb͕è-elu-igwe n'ubọchi ahu, we me ka ha b͕a aghara; ewe tib͕ue ha n'iru Israel. 11 Ndikom Israel we si na Mizpa puta, chua ndi Filistia, tib͕ue ha rue okpuru Bet-ka. 12 Samuel we were otù nkume do ya n'etiti Mizpa na Shen, kpọ aha-ya Eben-eza, si, Jehova eyerewo ayi aka rue ub͕u a. 13 Ewe me ka ndi Filistia ruru ala, ha abàghi ọzọ n'ókè-ala Israel: aka Jehova we digide ndi Filistia ubọchi nile nke Samuel. 14 Ewe nyeghachi Israel obodo nile nke ndi Filistia nara Israel, site n'Ekron we rue Gat; ókè-ala-ha ka Israel naputara n'aka ndi Filistia. Ma udo di n'etiti Israel na ndi-Amorait. 15 Samuel we kpe Israel ikpe ubọchi nile nke ndu-ya. 16 O we nēje buruburu kwa-arọ rue Bet-el, na Gilgal, na Mizpa; o we kpe Israel ikpe n'ebe ahu nile. 17 Nlata-ya bu na Rema, n'ihi na n'ebe ahu ka ulo-ya di; ọ bu kwa n'ebe ahu ka ọ kpere Israel ikpe: o we wuere Jehova ebe-ichu-àjà n'ebe ahu.

1 Samuel 8

1 O rue, mb͕e Samuel ghọrọ agadi, na o doro umu-ya ndikom ndi-ikpe ikpe Israel. 2 Ma aha ọkpara-ya bu Joel; aha nwa-ya nwoke nke-abua bu Abaija: ha bu ndi-ikpe nime Bia-sheba. 3 Ma umu-ya ndikom ejeghi kwa ije n'uzọ-ya nile, ha we wezuga onwe-ha soro urù nēzighi ezi, ha we nara ihe-iri-ngo, wezuga ikpé. 4 Ndi-okenye nile nke Israel we chikọta onwe-ha, biakute Samuel rue Rema: 5 ha we si ya, Le, gi onwe-gi aghọwo agadi, ma umu-gi ndikom adighi-eje ije n'uzọ-gi nile: ub͕u a mere ayi eze ikpe ayi ikpe dika mba nile. 6 Ma okwu ahu jọrọ njọ n'anya Samuel, mb͕e ha siri, Nye ayi eze ikpe ayi ikpe. Samuel we kpere Jehova. 7 Jehova we si Samuel, Ge nti olu ndim n'ihe nile ha nāsi gi: n'ihi na ọ bughi gi ka ha juworo, kama ọ bu Mu ka ha juworo, ka M'ghara iburu ha eze. 8 Dika omume nile si di nke ha meworo site n'ubọchi M'mere ka ha si n'Ijipt rigota we rue ta, ha we rapum, fè chi ọzọ òfùfè, otú a ka ha onwe-ha nēme kwa gi. 9 Ma ub͕u a ge nti olu-ha: nání na i gāb͕asiri ha àmà ike, gosi kwa ha ikpé eze ahu nke gābu eze-ha. 10 Samuel we gwa ndi Israel, ndi nāriọ eze n'aka-ya, okwu nile nke Jehova. 11 O we si, Nka gābu ikpé eze ahu nke gābu eze-unu: umu-unu ndikom ka ọ gāchiri, doro ha onwe-ya n'ub͕ọ-ala-ya na n'elu inyinya-ya; ha gānab͕a kwa ọsọ n'iru ub͕ọ-ala-ya: 12 o gēdo-kwa-ra ha onwe-ya ibu ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri, na ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom abua na iri; na ilu ọlu-ubi-ya, na iwe ihe-ubi-ya, na ikpu ihe-agha-ya nile, na ihe nile nke ub͕ọ-ala-ya. 13 Ọ bu kwa umu-unu ndinyom ka ọ gāchiri ibu ndi nāsugwa ude nēsì ísì utọ, na ibu ndi-odozi-anu, na ibu ndi-osi-ite. 14 Ubi-unu, na ubi-vine-unu, na ubi-olive-unu, bú nke kachasi nma, ka ọ gēwere kwa, nye ndi-orù-ya. 15 Nkpuru-ọghigha-unu na ubi-vine-unu ka ọ gēwere otù uzọ n'uzọ iri, nye ndi nējere ya ozi, nye kwa ndi-orù-ya. 16 Ọ bu kwa ndi-orù-unu ndikom, na ndinyom nējere unu ozi, na umu-okorọbia-unu, bú ndi kachasi nma, na inyinya-ibu-unu, ka ọ gēwere, me ka ha je ozi-ya. 17 Ìgwè ewu na aturu-unu ka ọ gēwere kwa otù uzọ n'uzọ iri: unu onwe-unu gābu-kwa-ra ya orù. 18 Unu gēti kwa nkpu n'ubọchi ahu n'ihi eze-unu nke unu rọputara onwe-unu; ma Jehova agaghi-aza unu n'ubọchi ahu. 19 Ma ndi Israel juru ige nti olu Samuel; ha si, É-è; kama, eze gāchiri ayi; 20 ka ayi we di, ọbuná ayi onwe-ayi, ka mba nile; ka eze-ayi we nēkpe kwa ayi ikpe, nāpu kwa je n'iru ayi, nēbu kwa agha-ayi. 21 Samuel we nu okwu nile nke ndi Israel, o we kwue ha na nti Jehova. 22 Jehova we si Samuel, Ge nti olu-ha, mere ha eze. Samuel we si ndikom Israel, Lanu, nwoke ọ bula n'obodo-ya.

1 Samuel 9

1 Ma otù nwoke Benjamin di, aha-ya bu Kish, nwa Abiel, nwa Zeroa, nwa Bekorat, nwa Afia, nwa onye Benjamin, bú dike nke bu dìnkpà. 2 Ọ nwe-kwa-ra nwa-nwoke, aha-ya bu Sọl, ọ bu nwa-okorọbia, ọ ma-kwa-ra nma: ọ dighi kwa nwoke n'etiti umu Israel mara nma kari ya: site n'ubu-ya we rue elu isi-ya ka ọ di ogologo kari onye ọ bula nime ndi Israel. 3 Ma nne-inyinya-ibu nile nke Kish, bú nna Sọl, nwere furu efu. Kish we si Sọl nwa-ya, Biko, kuru otù nime ndi-orù tiyere onwe-gi, bilie, je, chọ nne-inyinya-ibum. 4 O we gabiga n'ugwu Efraim, gabiga kwa n'ala Shalisha, ma ha achọtaghi ha: ha we gabiga n'ala Shaalim, ma ha adighi n'ebe ahu: o we gabiga n'ala Benjamin, ma ha achọtaghi ha. 5 Mb͕e ndi ahu batara n'ala Zuf, Sọl siri nwa-okorọbia-ya nke soro ya je, Bia, ka ayi laghachi; ka nnam we ghara igha iche uche bayere nne-inyinya-ibu-ya, we cheb͕u onwe-ya bayere ayi. 6 O we si ya, Biko, le, onye nke Chineke nọ n'obodo a, anāsọpuru kwa nwoke ahu; ihe nile ọ nēkwu aghaghi irè erè: ub͕u a ka ayi je n'ebe ahu; eleghi anya ọ gēgosi ayi uzọ-ayi nke ayi jeworo na ya. 7 Sọl we si nwa-okorọbia-ya, Ma, le, ọ buru na ayi eje, gini ka ayi gēji bakuru nwoke ahu? n'ihi na achicha alapuwo n'ihe-ayi, ọ dighi kwa onyinye iji bakuru onye nke Chineke: gini di n'aka-ayi? 8 Nwa-okorọbia ahu we za Sọl ọzọ, si, Le, achọtawo n'akam otù uzọ n'uzọ anọ nke shekel ọla-ọcha: m'gēnye kwa ya onye nke Chineke, ka o we gosi ayi uzọ-ayi. 9 (Na mb͕e gara aga n'Israel, otú a ka otu nwoke siri mb͕e o jere iju Chineke ase, Bianu, ka ayi jekuru onye-ọhu-uzọ: n'ihi na onye anākpọ Onye-amuma ta, anākpọ ya Onye-ọhu-uzọ na mb͕e gara aga). 10 Sọl we si nwa-okorọbia-ya, Okwu-gi di nma; bia, ka ayi je. Ha we je n'obodo ebe onye nke Chineke nọ. 11 Ka ndi ahu nārigo na nrigo obodo ahu, ha onwe-ha hutara umu-ab͕ọghọ ka ha nāputa isere miri, ha we si ha, Onye-ọhu-uzọ, ọ̀ nọ n'ebe a? 12 Ha we za ha, si, Ọ nọ, le, ọ nọ n'iru gi: me ngwa ub͕u a, n'ihi na ta ka ọ batara n'obodo; n'ihi na ndi Israel nwere àjà ta n'ebe di elu a: 13 mb͕e unu bara n'obodo, otú a ka unu gāchọta ya, tutu ọ rigorue ebe di elu iri ihe: n'ihi na ndi Israel agaghi-eri ihe rue mb͕e ọ biara, n'ihi na ya onwe-ya nāgọzi àjà-ha; emesia ndi akpọworo gēri ihe. Ma ub͕u a rigonu; n'ihi na ya onwe-ya, ub͕u a ka unu gāchọta ya. 14 Ha we rigorue obodo; ka ndi ahu nābà n'etiti obodo, le, Samuel nāputa izute ha, irigoru ebe di elu ahu. 15 Ma Jehova kpughepuru nti Samuel ka ọ nu ihe otù ubọchi tutu Sọl abia, si, 16 Dika mb͕e a echi M'gēzitere gi otù nwoke sitere n'ala Benjamin, i gēte kwa ya manu ibu onye-ndú ndim, bú Israel, ọ gāzọputa kwa ndim n'aka ndi Filistia: n'ihi na ahuwom ndim, n'ihi na iti-nkpu-ha abàwom na nti. 17 Mb͕e Samuel huru Sọl, Jehova we za ya, si, Le nwoke ahu onye M'siri gi te manu! onye a gēb͕ochi ndim n'ime ihe ọjọ. 18 Sọl we biarue Samuel nso n'etiti ọnu-uzọ-ama, si, Biko, gosim ebe ọ di, bú ulo onye-ọhu-uzọ. 19 Samuel we za Sọl, si, Mu onwem bu onye-ọhu-uzọ ahu; rigorue ebe di elu n'irum, unu gēsokwam ri ihe ta: m'gēzilaga kwa gi n'ututu, ihe nile nke di n'obi-gi ka m'gēgosi kwa gi. 20 Ma nne-inyinya-ibu-gi nke funariri gi, ta bu ubọchi atọ, atukwasila obi-gi na ha; n'ihi na achọtawo ha. Ma ònye nwere ihe nile anāchọsi ike nke Israel? ọ bughi gi na ulo nile nke nna-gi? 21 Sọl we za, si, Ọ̀ bughi onye Benjamin ka m'bu, sitere n'ebo Israel nke dikarisiri ntà? ab͕urum, ọ̀ pekarisighi npe n'etiti ab͕uru nile nke ebo Benjamin? n'ìhi gini kwa ka i gwaworom okwu dika okwu a si di? 22 Samuel we kuru Sọl na nwa-okorọbia-ya, me ka ha ba n'ime-ulo, o we nye ha isi ọnọdu n'etití ndi akpọrọ n'oriri ahu, ndi ahu ra ka orú madu na iri. 23 Samuel we si odozi-anu, Weta òkè nke m'nyere gi, nke m'siri gi, Dọba ya n'ebe i nọ. 24 Odozi-anu ahu we bulie utaku-ukwu ahu na ihe di n'elu ya, dọba ya n'iru Sọl. Samuel we si, Le ihe fọduru! dọba ya n'iru gi, rie; n'ihi na rue mb͕e akara àkà ka edebeworo gi nka, si, Akpọwom ndi Israel. Sọl we soro Samuel rie ihe ubọchi ahu. 25 Ha we si n'ebe di elu ahu rida n'obodo, o we kpayere Sọl uka n'elu-ulo. 26 Ha we bilie n'isi-ututu: o we rue, mb͕e chi bọrọ, na Samuel kpọrọ Sọl n'elu-ulo, si, Bilie, ka m'we zilaga gi. Sọl we bilie, ha abua we pua, ya onwe-ya na Samuel, rue èzí. 27 Ka ha onwe-ha nārida na nsọtu obodo, Samuel we si Sọl, Si nwa-okorọbia-gi gabiga n'iru ayi, (ọ we gabiga, ) ma gi onwe-gi guzogide ub͕u a, ka m'we me ka i nu okwu Chineke.

1 Samuel 10

1 Samuel we were karama manu, wukwasi ya n'isi-ya, sutu ya ọnu, si, Ọ̀ bughi na Jehova etewo gi manu ibu onye-ndú ihe-nketa-Ya? 2 Mb͕e i siri n'ebe m'nọ la ta, i gāhuta kwa ndikom abua n'akuku ílì Rechel n'ókè-ala Benjamin na Zelza; ha gāsi kwa gi, Achọtawo nne-inyinya-ibu nke i jere ichọ: ma, le, nna-gi arapuwo okwu nne-inyinya-ibu-ya, ọ nēcheb͕u kwa onwe-ya bayere unu, si, Gini ka m'gēme ichọta nwam? 3 I gēsi kwa n'ebe ahu gabiga n'iru, bia rue osisi terebinth nke Teboa, ma ndikom atọ ndi nārigokuru Chineke rue Bet-el gāhuta gi n'ebe ahu, otù onye nēbu umu-ewu atọ, otù onye nēbu ob͕e achicha atọ, otù onye nēbu kwa karama-akpukpọ manya-vine: 4 ha gāju kwa gi ajuju bayere udo-gi, we nye gi ob͕e achicha abua; i gānara kwa ha n'aka-ha. 5 Emesia i gābiaru ugwu ntà Chineke, ebe ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia di: ọ gēru kwa, mb͕e i biara n'ebe ahu rue obodo ahu, na i gēzute usu ndi-amuma ndi si n'ebe di elu ahu nārida; une na egwú-otiti na ọja na ubọ-akwara di kwa n'iru ha; ndi ahu ganēbu kwa amuma: 6 Mọ nke Jehova gādakwasi gi n'ike, i gēsoro kwa ha bū amuma, i gāb͕anwe kwa ghọ nwoke ọzọ. 7 O gēru kwa, mb͕e ihe-iriba-ama ndia biaruru gi aru, gi mere onwe-gi dika aka-gi si chọta; n'ihi na Chineke nọyere gi. 8 I gēbukwam uzọ rida rue Gilgal; ma, le, mu onwem nāridakute gi, isure àjà-nsure-ọku, na ichu ihe àjà nke àjà-udo: ubọchi asa ka i ganēche, rue mb͕e m'gābiakute gi, me ka i mara ihe i gēme. 9 O rue, mb͕e o chighariri azu-ya isi n'ebe Samuel nọ la, na Chineke b͕anwere ya obi ọzọ: ihe-iriba-ama ndia nile we rè n'ubọchi ahu. 10 Ha we biarue ebe ahu, rue ugwu ntà ahu, ma, le, usu ndi-amuma zutere ya; Mọ nke Chineke we dakwasi ya n'ike, o we bū amuma n'etiti ha. 11 O rue, mb͕e ndi nile ndi mara ya na mb͕e gara aga huru, ma, le, ọ nēso ndi-amuma bū amuma, ndi ahu we sirita onwe-ha, Gini bu nka nke mere nwa Kish? Sọl, ọ̀ di kwa n'etiti ndi-amuma? 12 Otù nwoke nke sitere n'ebe ahu we za, si, Ònye bu kwa nna-ha? N'ihi ya ọ ghọrọ ilu, bú okwu a, Sọl, ọ̀ di kwa n'etiti ndi-amuma? 13 O we bubìe amuma, bia rue ebe di elu ahu. 14 Nwa-nne nna Sọl we si ya na nwa-okorọbia-ya, Òle ebe unu jere? Ọ si, Ichọ nne-inyinya-ibu-ayi: ayi we hu na ọ dighi ebe ọ bula ha di, ayi we biakute Samuel. 15 Nwa-nne nna Sọl we si, Biko, gosim ihe Samuel siri unu. 16 Sọl we si nwa-nne nna-ya, O gosiri ayi nke-ọma na achọtawo nne-inyinya-ibu. Ma o gosighi ya okwu ala-eze ahu nke Samuel kwuru. 17 Samuel we kpọkọta ndi Israel ibiakute Jehova rue Mizpa; 18 o we si umu Israel, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Mu onwem mere ka Israel si n'Ijipt rigota, M'we naputa unu n'aka ndi Ijipt na n'aka ala-eze nile nke nēmeb͕u unu: 19 ma unu onwe-unu ajuwo Chineke-unu ta, Onye Ya onwe-ya nāzọputa unu n'aka ihe ọjọ unu nile na nkpab͕u nile unu; unu we si Ya, É-è, kama mere ayi eze. Ma ub͕u a guzonu onwe-unu n'iru Jehova n'ebo nile unu, na n'usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri unu. 20 Samuel we me ka ebo Israel nile biarue nso, nzà we ma ebo Benjamin. 21 O we me ka ebo Benjamin biarue nso n'ab͕uru nile ha, nzà we ma ab͕uru Matri: nzà we ma Sọl nwa Kish: ha we chọ ya, ma achọtaghi ya. 22 Ha we ju kwa Jehova ase ọzọ, si, Ọ̀ kābiaghi ebe a, bú nwoke ahu? Jehova we si, Le, onye ahu ezowo onwe-ya n'etiti ihe. 23 Ha we b͕a ọsọ, si n'ebe ahu kuru ya; o we guzo onwe-ya n'etiti ndi Israel, ma ọ di ogologo kari onye ọ bula nime ndi Israel site n'ubu-ya we rue elu isi-ya. 24 Samuel we si ndi Israel nile, Ùnu ahuwo onye ahu nke Jehova rọputaworo, na ọ dighi onye di ka ya n'etiti ndi Israel nile? Ndi Israel nile we tie nkpu, si, Ka eze-ayi di ndu. 25 Samuel we gwa ndi Israel ikpe ala-eze ahu, de kwa ya n'akwukwọ, dọba ya n'iru Jehova. Samuel we zilaga ndi Israel nile, nwoke ọ bula n'ulo-ya. 26 Sọl we la kwa n'ulo-ya rue Gibea; ndi bu dìnkpà, ndi Chineke meturu obi-ha aka, we jeso ya. 27 Ma ufọdu ndi jọb͕uru onwe-ha siri, Onye a, ò gēsi aṅa zọputa ayi? Ha we lelia ya, ha ewetaghi-kwa-ra ya onyinye-inata-iru-ọma. O we di ka onye nti chiri.

1 Samuel 11

1 Nehash, bú onye Amon, we rigota, ma ulo-ikwū-ya imegide Jebesh-gilead: ndikom nile nke Jebesh we si Nehash, Ka ayi na gi b͕a ndu, ayi gēfè kwa gi òfùfè. 2 Nehash, bú onye Amon, we si ha, Na nka ka mu na unu gāb͕a ndu, n'irukpọ unu anya aka-nri nile; m'gātukwasi kwa ya n'aru Israel nile ka ọ buru ihe-ita-uta. 3 Ndi-okenye Jebesh we si ya, Ra ayi aka ubọchi asa, ka ayi we zisa ndi-ozi n'ókè-ala nile nke Israel: ọ buru kwa na ọ dighi onye nāzọputa ayi, ayi gāpukuru kwa gi. 4 Ndi-ozi ahu we biarue Gibea nke Sọl, kwue okwu ndia na nti ndi Israel: ndi Israel nile we welie olu-ha kwa ákwá. 5 Ma, le, Sọl biara, nēso ìgwè ehi si n'ubi; Sọl we si, Gini nēme ndi Israel na ha nākwa ákwá? Ha we kọrọ ya okwu nile nke ndikom Jebesh. 6 Mọ nke Chineke we dakwasi Sọl n'ike mb͕e ọ nuru okwu ndia, iwe-ya we di ọku nke-uku. 7 O we chiri ehi abua, bọkasia ha, zisa ha n'ókè-ala nile nke Israel n'aka ndi-ozi, si, Onye ọ bula nke nāputaghi iso Sọl na iso Samuel n'azu, otú a ka agēme ehi-ya. Oké egwu nke Jehova we dakwasi ndi Israel, ha we puta dika otù nwoke. 8 O we gukọta ha na Bezek; umu Israel we di orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ iri-na-asa, na nnù iri, ndikom Juda di kwa orú nnù ndikom uzọ atọ, na nnù iri-na-ise. 9 Ha we si ndi-ozi biara, Otú a ka unu gāsi ndikom Jebesh-gilead, Echi ka nzọputa gādiri unu, mb͕e anyanwu nēkpo ọku. Ndi-ozi ahu we bia gosi ndikom Jebesh; ha we ṅuria ọṅu. 10 Ndikom Jebesh we si, Echi ka ayi gāpukuru unu, unu gēme kwa ayi dika ihe nile si di nke di nma n'anya-unu. 11 O rue, n'echi-ya, na Sọl doro ndi Israel n'usu atọ; ha we ba n'etiti ọmuma-ulo-ikwū n'iche-nche ututu, tib͕ue Amon rue ikpo-ọku nke ehihie: o rue, na ndi fọduru b͕asara, ọ fọdughi kwa ndikom abua n'otù ebe n'etiti ha. 12 Ndi Israel we si Samuel, Ònye ka ọ bu, bú onye nāsi, Sọl, ọ̀ gābu eze-ayi? nyenu ayi ndikom ahu, ka ayi we me ka ha nwua. 13 Sọl we si, Ọ dighi nwoke agēme ka ọ nwua ta: n'ihi na ta ka Jehova zọputara nzọputa n'Israel. 14 Samuel we si ndi Israel, Bianu, ka ayi jerue Gilgal, me ka ala-eze-unu di ọhu ọzọ n'ebe ahu. 15 Ndi Israel nile we jerue Gilgal; ha we me Sọl eze n'ebe ahu n'iru Jehova nime Gilgal; ha we chua ihe àjà nke àjà-udo n'iru Jehova n'ebe ahu. Sọl na ndikom nile nke Israel we ṅuria ọṅu nke-uku n'ebe ahu.

1 Samuel 12

1 Samuel we si Israel nile, Le, egewom nti olu-unu n'ihe nile nke unu sirim, m'we mere unu eze. 2 Ma ub͕u a, le, eze ahu nējeghari n'iru unu: ma mu onwem aghọwo agadi na onye-isi-awọ; ma umum ndikom, le, ha nọ n'etiti unu: ma mu onwem ejeghariwo n'iru unu site na mb͕e m'di na nwata rue ta. 3 Lem: b͕agidem àmà n'iru Jehova, na n'iru onye nke Ya etere manu: ọ̀ bu ehi onye ka m'naraworo? ma-ọbu ìnyinya-ibu onye ka m'naraworo? ma-ọbu ònye ka m'meb͕uworo? ònye ka m'zọpiaworo? ma-ọbu n'àka onye ka m'naraworo ihe-nb͕aputa iji zopu anyam n'aru ya? m'gēnyeghachi kwa unu ya. 4 Ha si, I meb͕ughi ayi, i zọpiaghi kwa ayi, i naraghi kwa ihe ọ bula n'aka nwoke ọ bula. 5 Ọ si ha, Onye-àmà ka Jehova bu imegide unu, onye-àmà ka onye nke Ya etere manu bu kwa ta, na unu achọtaghi ihe ọ bula n'akam. Ha we si, Onye-àmà ka Ọ bu. 6 Samuel we si ndi Israel, Ọ bu Jehova Nke mere Moses na Eron ndi-ndú, Nke me-kwa-ra nna-unu-hà ka ha si n'ala Ijipt rigota. 7 Ma ub͕u a, guzonu onwe-unu, ka mu na unu we kpe ikpe n'iru Jehova bayere ezi omume nile nke Jehova, nke O mere unu na nna-unu-hà. 8 Mb͕e Jekob batara n'Ijipt, mb͕e nna-unu-hà tikuru Jehova nkpu, Jehova we zite Moses na Eron, ndi mere ka nna-unu-hà si n'Ijipt puta, me kwa ka ha biri n'ebe a. 9 Ha we chezọ Jehova, bú Chineke-ha, O we renye ha n'aka Sisera, bú onye-isi usu-ndi-agha Hezoa, na n'aka ndi Filistia, na n'aka eze Moab, ha we buso ha agha. 10 Ha we tikue Jehova nkpu, si, Ayi emehiewo, n'ihi na ayi arapuwo Jehova, we fè Bealim na Ashtarot òfùfè: ma ub͕u a naputa ayi n'aka ndi-iro-ayi, ayi gēfè kwa Gi òfùfè. 11 Jehova we zite Jerubeal, na Bedan, na Jefta, na Samuel, we naputa unu n'aka ndi-iro-unu buruburu, unu we biri na ntukwasi-obi. 12 Unu we hu na Nehash, bú eze umu Amom, biara imegide unu, unu we sim, É-è, kama otù eze gāburu ayi eze: ma Jehova, bú Chineke-unu, bu eze-unu. 13 Ma ub͕u a le eze nke unu rọputaworo, onye unu riọrọm n'aka: ma, le, Jehova emewo ka eze nāchi unu. 14 Ọ buru na unu atua egwu Jehova, ọ buru kwa na unu efè Ya òfùfè, we ge nti olu-Ya, ọ buru kwa na unu anupughi isi n'okwu-ọnu Jehova, kama na unu nēsogide Jehova, bú Chineke-unu, ma unu onwe-unu ma eze-unu kwa nke bu eze-unu, ọ di nma: 15 ma ọ buru na unu egeghi nti olu Jehova, kama unu nānupu isi n'okwu-ọnu Jehova, aka Jehova gādi kwa imegide unu, otú ọ di imegide nna-unu-hà. 16 Ub͕u a kwa guzonu onwe-unu, hu ihe uku a, nke Jehova nēme n'anya-unu. 17 Ọ̀ bughi obìbì ọka wheat ta? M'gākpọku Jehova, Ọ gēnye kwa éb͕è-elu-igwe na miri-ozuzo; mara-kwa-nu hu kwa na ihe ọjọ unu riri nne, nke unu meworo n'anya Jehova, n'iriọrọ onwe-unu eze. 18 Samuel we kpọkue Jehova; Jehova we nye éb͕è-elu-igwe na miri-ozuzo ubọchi ahu: ndi Israel nile we tua egwu Jehova na Samuel nke-uku. 19 Ndi Israel nile we si Samuel, Kpere Jehova, bú Chineke-gi, ekpere bayere ndi-orù-gi, ka ayi ghara inwu: n'ihi na ayi atukwasiwo ihe ọjọ a na nmehie-ayi nile, n'iriọrọ onwe-ayi eze. 20 Samuel we si ndi Israel, Unu atula egwu: unu onwe-unu emewo ihe ọjọ a nile; nání unu ewezugala onwe-unu n'iso Jehova, kama werenu obi-unu nile fè Jehova òfùfè; 21 unu ewezuga-kwa-la onwe-unu: n'ihi na mb͕e ahu ka unu ganēso n'azu ihe tọb͕ọrọ n'efu, nke nādighi-abà urù, nke nādighi-anaputa kwa, n'ihi na ihe tọb͕ọrọ n'efu ka ha bu. 22 N'ihi na Jehova agaghi-arapu ndi-Ya n'ihi aha uku Ya: n'ihi na Jehova ekwewo ime unu ka unu buru Ya otù ndi. 23 Mu onwem kwa, ya burum ihe-árú, bú ka m'mehie megide Jehova n'igha ikpe ekpere bayere unu: ma m'gēzí unu ihe n'uzọ ahu di nma nke ziri ezi. 24 Nání tuanu egwu Jehova, were obi-unu nile fè Ya òfùfè n'ezi-okwu: n'ihi na, lenu ihe uku O meworo n'ebe unu nọ. 25 Ma ọ buru na unu eme ihe ọjọ nāga n'iru, agēkpochapu unu, ma unu onwe-unu ma eze-unu.

1 Samuel 13

1 Sọl b͕ara arọ mb͕e ọ malitere ibu eze; ọ we buru eze Israel arọ abua. 2 Sọl we rọputara onwe-ya nnù ndikom asa na ọgu iri sitere n'Israel; nnù ndikom ise we di n'aka Sọl nime Mikmash na n'ugwu Bet-el, nnù ndikom abua na ọgu iri di kwa n'aka Jonatan nime Gibea Benjamin: ma o zilagara ndi fọduru n'etiti ndi Israel, onye ọ bula n'ulo-ikwū-ya. 3 Jonatan we tib͕ue ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia nke di na Geba, ndi Filistia we nu ya. Sọl we fùa opì-ike n'ala ahu nile, si, Ka ndi-Hibru nu. 4 Israel nile we nu, si, na Sọl tib͕uru ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia, na Israel aghọwo-kwa-ra ndi Filistia ihe nēsì ísì ọjọ. Ewe kpọkọta ndi Israel iso Sọl rue Gilgal. 5 Ndi Filistia we chikọta onwe-ha ibuso Israel agha, orú nnù ub͕ọ-ala uzọ atọ na nnù iri-na-ise, na nnù ndi-inyinya iri-na-ise, na ndi-agha dika ájá nke di n'usọ oké osimiri n'uba: ha we rigota, ma ulo-ikwū-ha na Mikmash, n'akuku Iru-anyanwu Bet-even. 6 Ndikom Israel we hu na nkpà nākpà ha, (n'ihi na anāchi Israel n'ihe-ike), ndi Israel we zo onwe-ha n'ọb͕à, na n'ọhia-ogwu, na nime nkume di elu, na n'ulo-elu, na n'olùlù. 7 Ma ndi-Hibru ufọdu gabigara Jọdan rue ala Gad na Gilead; ma Sọl nọgidere na Gilgal, ndi Israel nile ma-kwa-ra jijiji nēso ya n'azu. 8 O we chere ubọchi asa, dika mb͕e akara àkà si di nke Samuel kara: ma Samuel abiarughi Gilgal; ndi Israel we si n'ebe ọ nọ b͕asa. 9 Sọl we si, Wetaram àjà-nsure-ọku ahu na àjà-udo nile nso. O we sure àjà-nsure-ọku ahu. 10 O rue, mb͕e o surebìri àjà-nsure-ọku ahu, le, Samuel biara; Sọl we pua izute ya, ka o we gọzie ya. 11 Samuel we si, Gini ka i meworo? Sọl we si, N'ihi na ahurum na ndi Israel esiwo n'ebe m'nọ b͕asa, ma gi onwe-gi abiaghi n'ubọchi akara àkà, ndi Filistia nāchikọta kwa onwe-ha na Mikmash; 12 m'we si, Ub͕u a ka ndi Filistia gāridakutem rue Gilgal, ma emeghm ka iru Jehova dajua; m'we jisie onwem ike, we sure àjà-nsure-ọku ahu. 13 Samuel we si Sọl, I mewo ihe-nzuzu: i debeghi ihe Jehova, bú Chineke-gi, nyere n'iwu, bú nke O nyere gi n'iwu: n'ihi na ub͕u a Jehova gēmewori ka ala-eze-gi guzosie ike n'ebe Israel nọ rue mb͕e ebighi-ebi. 14 Ma ub͕u a ala-eze-gi agaghi-eguzosi ike: Jehova achọputaworo Onwe-ya otù nwoke dika obi-Ya si chọ, Jehova enyewo kwa ya iwu ibu onye-ndú ndi-Ya, n'ihi na i debeghi ihe ahu nke Jehova nyere gi n'iwu. 15 Samuel we bilie, si na Gilgal rigorue Gibea Benjamin. Sọl we gukota ndi Israel, bú ndi ahutara n'aka-ya, ihe ra ka nnù ndikom na ọgu iri. 16 Sọl, na Jonatan nwa-ya, na ndi ahutara n'aka-ha, we nọdu na Geba Benjamin: ma ndi Filistia mara ulo-ikwū-ha na Mikmash. 17 Ndi-nbibi we si n'ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia puta n'usu atọ: otù usu chere iru n'uzọ Ọfra, rue ala Shual: 18 otù usu we che iru n'uzọ Bet-horon: otù usu we che iru n'uzọ ókè-ala nke nēlekwasi ndagwurugwu Zeboim anya, n'ebe ọzara di. 19 Ma achọtaghi uzú ọ bula n'ala nile nke Israel: n'ihi na ndi Filistia siri, Ka ndi-Hibru we ghara ikpu mma-agha ma-ọbu ube: 20 Israel nile we ridakuru ndi Filistia iti ihe-ọlu-ha ufe, onye ọ bula ígwè-ikpọzè-ala-ya, na mma-ọgè-ya, na anyu-ike-ya, na ọ́gù-ya; 21 (ọnu ọ́gù na nke nma-ọgè na nke ndudu-ilu-ọlu-ubi na nke anyu-ike we ghara idi nkọ); na ikpu ọnu ndudu eji achu ehi. 22 O rue, n'ubọchi agha, na ahutaghi mma-agha ma-ọbu ube n'aka onye ọ bula n'etiti ndi soro Sọl na ndi soro Jonatan: ma ahutara n'aka Sọl na n'aka Jonatan nwa-ya. 23 Ndi ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia we pua rue ngabiga Mikmash.

1 Samuel 14

1 Ubọchi we rue mb͕e Jonatan nwa Sọl siri nwa-okorọbia nēbu ihe-agha-ya, Bia, ka ayi gabiga rue ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia, nke di n'ofè ọzọ ahu. Ma o gosighi nna-ya. 2 Ma Sọl nānọdu na nsọtu Gibea n'okpuru osisi pomegranate nke di na Migron: ndi nọ n'aka-ya ra ka nnù ndikom na ọgu iri; 3 Ahaija, nwa Ahaitub, nwa-nne Ikabod, nwa Finehas, nwa Ilai, bú onye-nchu-aja Jehova na Shailo, nọ kwa, ọ nēyi ephod. Ndi ahu amaghi kwa na Jonatan ejewo. 4 Ma n'etiti ngabiga abua ahu, nke Jonatan chọrọ isi na ha gabiga rue ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia, otú ọnu nkume di elu di n'otù ofè, otù ọnu nkume di elu di kwa n'ofè ọzọ: aha otù bu Bozez, aha nke-ọzọ bu Sene. 5 Otù ọnu bu ogidi n'akuku Ugwu na ncherita-iru Mikmash, nke-ọzọ n'akuku Ndida na ncherita-iru Geba. 6 Jonatan we si nwa-okorọbia nēbu ihe-agha-ya, Bia, ka ayi gabiga rue ebe-nguzo-ndi-agha nke ndia anēbìghi úgwù: eleghi anya Jehova gāluru ayi ọlu: n'ihi na ihe-nb͕ochi adighi n'ebe Jehova nọ izọputa site n'iwere ọtutu madu ma-ọbu site n'iwere madu ole-na-ole. 7 Onye nēbu ihe-agha-ya we si ya, Me ihe nile nke di n'obi-gi: chigharia onwe-gi, le, mu onwem nēso gi dika obi-gi si chọ. 8 Jonatan we si, Le, ayi onwe-ayi nāgabiga rue ndikom ahu, ayi gēkpughe-kwa-ra ha onwe-ayi. 9 Ọ buru na ha asi ayi otú a, Guzonu du rue mb͕e ayi ruru unu aru; ayi gēguzo kwa n'ọnọdu-ayi, ayi agaghi-arigokuru kwa ha. 10 Ma ọ buru na ha asi otú a, Rigokutenu ayi; ayi gārigo kwa: n'ihi na Jehova enyewo ha n'aka-ayi: nka gābu-kwa-ra ayi ihe-iriba-ama. 11 Ha abua we kpughere ndi ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia onwe-ha: ndi Filistia we si, Le, ndi-Hibru nēsi n'ọnu di iche iche ebe ha zoro onwe-ha puta. 12 Ndikom ebe-nguzo-ndi-agha ahu we za Jonatan na onye nēbu ihe-agha-ya, si, Rigokutenu ayi, ayi gēme kwa ka unu mara ihe. Jonatan we si onye nēbu ihe-agha-ya, Sorom n'azu rigo: n'ihi na Jehova enyewo ha n'aka Israel. 13 Jonatan we bikwasi aka-ya na ukwu-ya rigo, onye nēbu ihe-agha-ya nēso kwa ya n'azu: ha we da n'iru Jonatan; onye nēbu ihe-agha-ya nēme kwa ka ha nwua n'azu ya. 14 Ntib͕u mbu ahu, nke Jonatan na onye nēbu ihe-agha-ya tib͕uru, we ra ka orú ndikom, n'ihe ra ka nkera furrow nke otù acre ala-ubi n'ọtùtù. 15 Ọma-jijiji we di n'ọmuma-ulo-ikwū, na n'ọhia, na n'etiti ndi ahu nile; ndi ebe-nguzo-ndi-agha na ndi-nbibi, ha onwe-ha ma-kwa-ra jijiji: ala de-kwa-ra ùdé; o we ghọ ọma-jijiji nke Chineke. 16 Ndi-nche Sọl nwere na Gibea Benjamin we hu; ma, le, ìgwè madu ahu b͕azere, we nēje iru na azu. 17 Sọl we si ndi ya na ha nọ, Biko, gukọtanu, hu onye siworo n'etiti ayi pua. Ha we gukọta, ma, le, Jonatan na onye nēbu ihe-agha-ya anọghi ya. 18 Sọl we si Ahaija, Bute ib͕e Chineke nso. N'ihi na ib͕e Chineke di n'etiti umu Israel n'ubọchi ahu. 19 O rue, mb͕e Sọl nāgwa onye-nchu-àjà ahu okwu, na ùzù nke di n'ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia we nāda kari, nāga n'iru nāba kwa uba: Sọl we si onye-nchu-àjà, Sepu aka-gi. 20 Sọl na ndi nile ya na ha nọ we kpọkọta onwe-ha, ba n'agha ahu: ma, le, mma-agha nwoke ọ bula digidere ibe-ya, oké ọb͕ub͕a-aghara uku we di. 21 Ma ndi-Hibru ndi diri ndi Filistia na mb͕e gara aga, ndi soro ha rigo n'ọmuma-ulo-ikwū buruburu, ndi ahu we chighari kwa idi n'akuku Israel ndi nọ n'aka Sọl na Jonatan. 22 Ndikom nile nke Israel ndi zoro onwe-ha n'ugwu Efraim we nu na ndi Filistia ab͕alagawo, ha onwe-ha we sogidesi kwa ha ike n'agha ahu. 23 Jehova we zọputa Israel n'ubọchi ahu: agha ahu we gabiga rue Bet-even. 24 Ma achiri ndikom Israel n'ihe-ike ubọchi ahu: Sọl we b͕a ndi Israel iyi, si, Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu nke nēri nri rue anyasi, ru kwa mb͕e m'bọsiri ọ́bọ̀ n'aru ndi-irom. Ndi Israel nile we ghara idetu nri ọnu. 25 Ndi ala ahu nile we ba n'oké ọhia; ma manu-aṅu di n'elu ọhia. 26 Ndi Israel we ba n'oké ọhia ahu, ma, le, manu-aṅu nērù erù: ma ọ dighi onye kwere ka aka-ya rue ọnu-ya; n'ihi na ndi Israel turu egwu ọb͕ub͕a-iyi ahu. 27 Ma Jonatan anughi mb͕e nna-ya b͕ara ndi Israel iyi: o we setipu ọnu-ọnu nkpa-n'aka nke di n'aka-ya, rutu ya nime ub͕ub͕ọ-manu-aṅu, weghachi aka-ya n'ọnu-ya; anya-ya we nwue enwu. 28 Otù nwoke n'etiti ndi Israel we za, si, Nna-gi b͕asiri ndi Israel iyi ike, si, Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu nke nēri nri ta. Ndi Israel we nāda #mbà. 29 Jonatan we si, Nnam emekpawo ala-ayi aru: biko, lenu na anyam enwuwo enwu, n'ihi na edetuwom nwantī manu-aṅu nka ire. 30 Ànya ndi Israel gēsi aṅa ghara inwukari enwu nke-uku, ma ọ buru na ha rijuru afọ ta site n'ihe-nkwata ndi-iro-ha nke ha hutara? n'ihi na ub͕u a ntib͕u n'etiti ndi Filistia abaghi uba. 31 Ha we tib͕ue ufọdu nime ndi Filistia n'ubọchi ahu site na Mikmash rue Ajalon: ndi Israel we da #mbà nke-uku. 32 Ndi Israel we dakwasi ihe akwatara n'agha, ha we chiri ìgwè ewu na aturu, na ìgwè ehi, na umu-ehi, b͕ue ha n'ala ahu: ndi Israel we rie ha na ọbara. 33 Ha we gosi Sọl, si, Le, ndi Israel nēmehie megide Jehova n'iri anu, ya na ọbara. O we si, Unu aghọwo aghughọ: kpọrekutem nkume uku ta. 34 Sọl we si, B͕asanu onwe-unu n'etiti ndi Israel, si ha, Wetaranum nso, nwoke ọ bula ehi-ya, na nwoke ọ bula aturu-ya, b͕u-kwa-nu ha n'ebe a, rie; unu emehie-kwa-la megide Jehova n'iri anu. ya na ọbara. Ndi Israel nile we weta nso, nwoke ọ bula ehi-ya n'aka-ya n'abali ahu, ha we b͕ue ha n'ebe ahu. 35 Sọl we wuere Jehova ebe-ichu-àjà: nke ahu ka ọ malitere iwu ka ọ buru ebe-ichu-àjà diri Jehova. 36 Sọl we si, Ka ayi rida sochie ndi Filistia n'azu n'abali, luta ihe-ha n'agha rue ìhè ututu, ka ayi ghara kwa ikwe ka nwoke fọdu n'etiti ha. Ha we si, Me ihe ọ bula nke di nma n'anya-gi. Onye-nchu-àjà we si, Ka ayi biarue Chineke nso n'ebe a. 37 Sọl we jua Jehova ase, si, M'gārida sochie ndi Filistia n'azu? Ì gēnye ha n'aka Israel? Ma Ọ zaghi ya n'ubọchi ahu. 38 Sọl we si, Biaruenu nso n'ebe a, unu ndi-isi nile nke ndi Israel: mara-kwa-nu hu ihe nke nmehie a diworo nime ya ta. 39 N'ihi na Jehova nādi ndu, Onye nāzọputa Israel; n'ezie ọ buru na ọ di nime Jonatan nwam, n'ezie ọ ghaghi inwu. Ma ọ dighi onye nāza ya okwu n'etiti ndi Israel nile. 40 O we si Israel nile, Unu onwe-unu nọ n'otù ofè, mu onwem na Jonatan nwam gānọ kwa n'ofè nke-ọzọ. Ndi Israel we si Sọl, Me ihe nke di nma n'anya-gi. 41 Sọl we si Jehova, bú Chineke Israel, Nye nzà zuru okè. Nzà we ma Jonatan na Sọl: ma ndi Israel puru ya. 42 Sọl we si, Fenu nzà n'etiti mu na Jonatan nwam. Nzà we ma Jonatan. 43 Sọl we si Jonatan, Gosim ihe i meworo. Jonatan we gosi ya, si, N'ezie ewerem ọnu-ọnu nkpa-n'aka nke di n'akam detu nwantī manu-aṅu ire; lem, m'gānwu. 44 Sọl we si, Chineke me otú a, me kwa ihe ọzọ otú a: n'ihi na i ghaghi inwu, Jonatan. 45 Ndi Israel we si Sọl, Jonatan, ọ̀ gānwu, bú onye zọputara nzọputa uku a n'Israel? ya buru ihe-árú: Jehova nādi ndu, ọ dighi otù nime agiri-isi nke isi-ya gādaru ala; n'ihi na ya na Chineke aluwo ọlu ta. Ndi Israel we b͕aputa Jonatan, o we ghara inwu. 46 Sọl we si n'iso ndi Filistia rigo: ndi Filistia we la n'ebe nke ha. 47 Ma Sọl were ala-eze ahu, buru eze Israel, o we bue agha megide ndi-iro-ya nile buruburu, megide Moab, megide kwa umu Amon, megide kwa Edom, megide kwa ndi-eze Zoba, megide kwa ndi Filistia: ma n'ebe ọ bula ọ nēcheghari iru ọ nālub͕u ha. 48 O we me ihe dìnkpà, tib͕u kwa Amalek, we naputa Israel n'aka ndi nāpunara ha ihe. 49 Ma umu-ndikom Sọl bu Jonatan, na Ishvi, na Malki-shua: aha umu-ya ndinyom abua kwa: aha nke ada-ya bu Mirab, aha nke-ntà bu Maikal: 50 aha nwunye Sọl bu Ahinoam nwa Ahimaaz: aha onye-isi usu-ndi-agha-ya bu Abnea nwa Nea, nwa-nne nna Sọl. 51 Kish bu nna Sọl; Nea nna Abnea bu nwa Abiel. 52 Agha we sie ike megide ndi Filistia ubọchi nile nke Sọl: mb͕e Sọl huru nwoke ọ bula bu dike, ma-ọbu nwoke ọ bula bu dìnkpà, o were ya n'onwe-ya.

1 Samuel 15

1 Samuel we si Sọl, Mu ka Jehova zitere ite gi manu ka i buru eze ndi-Ya, bú Israel: ma ub͕u a ge nti olu okwu Jehova. 2 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Elekọtawom ihe Amalek mere Israel, ihe o doro ya n'uzọ, mb͕e o siri n'Ijipt rigota. 3 Ub͕u a je tib͕ue Amalek, wezuga ihe nile ọ bula o nwere ka ebibie ya, enwe-kwa-la ọmiko n'aru ya; kama me ka ha nwua, ma nwoke ma nwayi, ma nwatakiri ma nwa nāṅu ara, ma ehi ma aturu, ma camel ma inyinya-ibu. 4 Sọl we me ka ndi Israel nuru, o we gukọta ha na Telaim, orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ ise ndi ji ukwu eje, na orú nnù ndikom Juda na nnù ise. 5 Sọl we biarue obodo Amalek, rue nbì nime ndagwurugwu. 6 Sọl we si ndi-Kinait, Jenu, wezuga onwe-unu, si n'etiti ndi Amalek rida, ka m'we ghara ikpochapu unu na ha: n'ihi na unu onwe-unu mere umu Israel nile ebere, mb͕e ha siri n'Ijipt rigota. Ndi-Kinait we si n'etiti Amalek wezuga onwe-ha. 7 Sọl we tib͕ue Amalek, site na Havila ebe i nābà Shua, nke di n'iru Ijipt. 8 Ọ we nwude Egag, bú eze Amalek, na ndu, were ọnu mma-agha wezuga ndi ahu nile ka ebibie ha. 9 Ma Sọl na ndi Israel nwere ọmiko n'aru Egag, na n'aru anu kachasi nma nke ìgwè ewu na aturu, na nke ìgwè ehi, na nke umu anu mara abuba, na n'aru umu-aturu, na n'aru ihe nile di nma, ha ekweghi kwa iwezuga ha ka ebibie ha: ma anu-ulo ọ bula nke di nlelì nke ta-kwa-ra aru, nke ahu ka ha wezugara ka ebibie ya. 10 Okwu Jehova we rue Samuel nti, si, 11 Echeghariwom na emewom Sọl eze: n'ihi na o siwo n'isom n'azu laghachi, ma o meghi ka okwum guzosie ike. Iwe Samuel we di ọku; o we tikue Jehova nkpu abali ahu nile. 12 Samuel we bilie n'isi-ututu izute Sọl n'ututu; ewe gosi Samuel, si, Sọl biaruru Kamel, ma, le, ọ nēguzoro onwe-ya ihe-ncheta, o we je buruburu, gabiga, ridarue Gilgal. 13 Samuel we biakute Sọl: Sọl we si ya, Onye agọziri agọzi n'ebe Jehova nọ ka i bu: emewom ka okwu Jehova guzosie ike. 14 Samuel we si, Gini bu kwa olu ìgwè aturu na ewu a na ntim, ya na olu ìgwè ehi nke mu onwem nānu? 15 Sọl we si, Ọ bu n'etiti ndi Amalek ka ha si chita ha: n'ihi na ndi Israel nwere ọmiko n'aru anu kachasi nma nke ìgwè ewu na aturu na nke ìgwè ehi, ka ha we chuara Jehova, bú Chineke-gi, àjà; ma ayi ewezugawo nke fọduru ka ebibie ya. 16 Samuel we si Sọl, Ra aka, m'gēgosi kwa gi okwu nke Jehova gwaworom n'abali a. O we si ya, Kwue. 17 Samuel we si, Ọ bu ezie na onye ntà ka i bu n'anya gi onwe-gi, ma ọ̀ bughi onye-isi ebo nile nke Israel ka emere gi? Jehova we te gi manu ka i buru eze Israel; 18 Jehova we ziga gi ije ije, si, Je wezuga ndi-nmehie ahu, bú ndi Amalek, ka ebibie ha, i gēbuso kwa ha agha rue mb͕e agēme ka ha gwusia. 19 N'ìhi gini kwa ka i nēgeghi nti olu Jehova, kama i dakwasiri ihe-nkwata, we me ihe ọjọ n'anya Jehova? 20 Sọl we si Samuel, N'ezie egewom nti olu Jehova, we je ije ahu nke Jehova zigaram, m'we me ka Egag eze Amalek bia, ma ewezugaram Amalek ka ebibie ya. 21 Ma ndi Israel chiri ufọdu nime ihe-nkwata ichuru Jehova, bú Chineke-gi, àjà, nime Gilgal, bú ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, isi ihe n'ihe ewezugara ka ebibie ya. 22 Samuel we si, Àjà-nsure-ọku na àjà ọzọ, hà nātọ Jehova utọ dika ige nti olu Jehova? Le, ige nti di nma kari ichu àjà, iṅa nti di nma kari abuba ebulu. 23 N'ihi na nmehie nke iju-ase n'aka ndi-mọ ka nnupu-isi bu, ikpere-arusi na terafim ka isi-ike bu kwa. N'ihi na i juwo okwu Jehova, Ọ juwo kwa gi ka i ghara ibu eze. 24 Sọl we si Samuel, Emehiewom: n'ihi na agabigawom okwu-ọnu Jehova na okwu-gi nile: n'ihi na aturum egwu ndi Israel, we ge nti olu-ha. 25 Ma ub͕u a, biko, b͕aghara nmehiem, sorokwam laghachi, ka m'we kpọ isi ala nye Jehova. 26 Samuel we si Sọl, M'gaghi-esoro gi laghachi: n'ihi na i juwo okwu Jehova, Jehova ajuwo kwa gi ka i ghara ibu eze Israel. 27 Samuel we chigharia ila, ma o jidere ọnu-ọnu uwe-nwuda-ya, o we dọwa. 28 Samuel we si ya, Jehova adọwapuwo ala-eze Israel n'aru gi ta, nye ya madu-ibe-gi, nke di nma kari gi. 29 Ọzọ kwa, Ebube Israel agaghi-ekwu okwu-ugha, Ọ gaghi-echeghari kwa: n'ihi na Ọ bughi madu nke Ọ gēji cheghari. 30 O we si, Emehiewom: biko, sọpurum ub͕u a n'iru ndi-okenye ndim, na n'iru Israel; sorokwam laghachi, ka m'we kpọ isi ala nye Jehova, bú Chineke-gi. 31 Samuel we laghachi soro Sọl n'azu; Sọl we kpọ isi ala nye Jehova. 32 Samuel we si, Menu ka Egag eze Amalek biaruem nso. Egag we biakute ya n'iru-utọ. Egag we si, N'ezi-okwu ilu ọnwu ewezugawo onwe-ya. 33 Samuel we si, Dika mma-agha-gi meworo ndinyom ka ha b͕ara aka nwa, otú a ka nne-gi gāb͕ara aka nwa n'etiti ndinyom. Samuel we b͕ukasia Egag n'iru Jehova nime Gilgal. 34 Samuel we la na Rema; Sọl we rigorue ulo-ya, rue Gibea nke Sọl. 35 Samuel abiaghi kwa ọzọ ihu Sọl rue ubọchi ọnwu-ya; n'ihi na Samuel nēruru Sọl újú: ma Jehova cheghariri na o mere Sọl ka ọ buru eze Israel.

1 Samuel 16

1 Jehova we si Samuel, Rùe ole mb͕e ka gi onwe-gi ganēruru Sọl újú, ebe Mu onwem juworo ya ka ọ ghara ibu eze Israel? b͕ajue manu na mpi-gi, je, M'gēziga gi jekuru Jesi onye Bet-lehem: n'ihi na ahutaworom onwem eze n'etiti umu-ya ndikom. 2 Samuel we si, M'gēsi aṅa je? ọ buru na Sọl anu ya, ọ gēb͕um. Jehova we si, I gēwere nwa-ab͕ọghọ-ehi n'aka-gi, si, Ichuru Jehova àjà ka m'biaworo. 3 I gākpọ kwa Jesi ibia n'ichu-aja ahu, Mu onwem gēme kwa ka i mara ihe i gēme: i gēte-kwa-ram ya manu, bú onye M'gāsi gi te. 4 Samuel we me ihe ahu nke Jehova kwuru, ọ biarue Bet-lehem. Ndi-okenye obodo ahu we ma jijiji izute ya, si, Ọ̀ bu n'udo ka i biaworo? 5 Ọ we si, Ọ bu n'udo: ichuru Jehova àjà ka m'biaworo: donu onwe-unu nsọ, sorom bia n'ichu-àjà ahu. O we do Jesi na umu-ya ndikom nsọ, kpọ ha bia n'ichu-aja ahu. 6 O rue, mb͕e ha biara, na ọ huru Elaiab, o we si, N'ezie, ọ nọ n'iru Jehova, bú onye nke Ya etere manu. 7 Ma Jehova siri Samuel, Elegidela iru-ya anya, elegide-kwa-la ogologo nke idi-elu-ya; n'ihi na ajuwom ya: n'ihi na Jehova adighi-ahu dika madu si ahu; n'ihi na madu nēle ihe anya nāhu, ma Jehova nēle obi. 8 Jesi we kpọ Abinadab, me ka ọ gābiga n'iru Samuel. Ọ si, Jehova arọputaghi kwa nka. 9 Jesi we me ka Shama gabiga. Ọ si, Jehova arọputaghi kwa nka. 10 Jesi we me ka madu asa nime umu-ya ndikom gabiga n'iru Samuel. Samuel we si Jesi, Jehova arọputaghi ndia. 11 Samuel we si Jesi, Hà agwuwo, bú umu-okoro-gi? Ọ si, Ọ fọdu-kwa-ra ọdudù-nwam, ma, le, ọ nāzù aturu. Samuel we si Jesi, Ziga kuta ya: n'ihi na ayi agaghi-anọdu buruburu rue mb͕e ọ biara n'ebe a. 12 Ọ we ziga, me ka ọ bia. Ma nwa-okorọbia ahu nācha ọbara-ọbara, anya-ya abua ma-kwa-ra nma, ọ di kwa nma ile anya. Jehova we si, Bilie, te ya manu: n'ihi na nka bu ya. 13 Samuel we were mpi manu ahu, te ya n'etiti umu-nne-ya: Mọ nke Jehova we nādakwasi Devid n'ike site n'ubọchi ahu ga n'iru. Samuel we bilie, la Rema. 14 Ma Mọ nke Jehova wezugara Onwe-ya n'ebe Sọl nọ, mọ ọjọ we si n'ebe Jehova nọ me ka ọ tua egwu nke-uku. 15 Ndi-orù Sọl we si ya, Biko, le, mọ ọjọ nke Chineke nēme ka i tua egwu. 16 Biko, ka onye-nwe-ayi si ndi-orù-ya, ndi nọ n'iru gi, ka ha chọ nwoke nke mara ọkpukpọ-ubọ-akwara nke-ọma: ọ gēru kwa, mb͕e mọ ọjọ ahu nke Chineke dikwasi n'aru gi, na ọ gēwere aka-ya kpọ ubọ, ọ gādi kwa gi nma. 17 Sọl we si ndi-orù-ya, Biko, hutaranum nwoke nke nākpọ ubọ nke-ọma, me-kwa-nu ka ọ biakutem. 18 Otù nime umu-okorọbia-ya we za, si, Le, ahuwom otù nwa Jesi, bú onye Bet-lehem, onye mara ikpọ ubọ nke-ọma, ọ bu kwa dike nke bu dìnkpà, buru kwa nwoke agha, o nwe-kwa-ra uche n'okwu, buru kwa nwoke mara nma n'aru, Jehova nọye-kwa-ra ya. 19 Sọl we zigara Jesi ndi-ozi, si, Ziterem Devid nwa-gi, nke nọ n'etiti ìgwè ewu na aturu. 20 Jesi we were otù inyinya-ibu nke eboro ya achicha, na otù karama-akpukpọ manya-vine, na otù nwa-ewu, we zigara Sọl n'aka Devid, bú nwa-ya. 21 Devid we biakute Sọl, guzo n'iru ya: o we hu ya n'anya nke-uku; o we ghọrọ ya onye nēbu ihe-agha. 22 Sọl we zigara Jesi ozi, si, Biko, ka Devid guzo n'irum; n'ihi na ọ hutawo amara n'irum. 23 O rue, mb͕e mọ ọjọ ahu nke Chineke di n'aru Sọl, na Devid were ubọ-akwara-ya, were aka-ya kpọ ya: aru we dajua Sọl, o we di ya nma, mọ ọjọ ahu we si n'ebe ọ nọ wezuga onwe-ya.

1 Samuel 17

1 Ma ndi Filistia chikọtara ọmuma-ulo-ikwū-ha ibu agha, ewe chikọta ha na Soko, nke Juda nwe, ha we ma ulo-ikwū-ha n'etiti Soko na Azeka, n'Efes-damim. 2 Sọl na ndikom Israel we chikọta onwe-ha, ma ulo-ikwū-ha na ndagwurugwu Ila, we do agha n'usoro izute ndi Filistia. 3 Ndi Filistia we nēguzo n'ugwu n'otù akuku, Israel nēguzo kwa n'ugwu n'akuku nke-ọzọ: ndagwurugwu we di n'etiti ha. 4 Onye-nputa-ọb͕ọ-agha we si n'ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia puta, aha-ya bu Gọlaiat, sitere na Gat, ogologo-ya di cubit isi na otù ntù-aka. 5 Okpu-agha ọla di kwa n'isi-ya, ọ bu kwa uwe-agha emere dika akpirikpa-azù ka eyikwasiri ya; ọtùtù uwe-agha ahu di nnù shekel ọla iri-na-abua na ọgu iri. 6 Ihe-ọla eji kpuchi ukwu di kwa n'ukwu-ya abua, nkpunkpu ube ọla di kwa n'etiti ubu-ya abua. 7 Osisi ube-ya di kwa ka oké ókpòrò di arọ́ nke ọkpa-ákwà ji akpa ákwà; isi ube-ya di nnù shekel ígwè na ọgu iri: onye nēbu ọta-ya nēje n'iru ya. 8 O we guzo kpọ usoro-agha nile nke Israel òkù, si ha, N'ìhi gini ka unu putaworo ido agha-unu n'usoro? mu onwem, àbughm onye Filistia? ma unu onwe-unu, ùnu abughi ndi-orù Sọl nwe? rọputaranu onwe-unu otù nwoke, ka ọ ridakutekwam. 9 Ọ buru na ọ puru ilusom ọ̀gù, we tib͕uem, ayi gābu-kwa-ra unu ndi-orù: ma ọ buru na mu onwem puru ilub͕u ya, we tib͕ue ya, unu gābu-kwa-ra ayi ndi-orù, we fè ayi òfùfè. 10 Onye Filistia ahu we si, Mu onwem atawo usoro-agha nile nke Israel uta ta; nyenum otù nwoke, ka ayi we lurita ọ̀gù. 11 Sọl na Israel nile we nu okwu nile ndia nke onye Filistia, ha we tua ujọ, tua egwu nke-uku. 12 Ma Devid bu nwa onye Efrat ahu nke Bet-lehem-juda, nke aha-ya bu Jesi; o nwe-kwa-ra umu-ndikom asatọ: nwoke ahu aghọwo kwa agadi n'etiti ndikom n'ubọchi Sọl. 13 Umu-ndikom atọ nke Jesi ndi bu okenye we je soro Sọl ibu agha: aha umu-ya ndikom atọ ndi jere agha bu Elaiab ọkpara-ya, na Abinadab nke so ya, na Shama, bú nke-atọ. 14 Ma Devid, ya onwe-ya bu ọdudù-nwa: atọ ahu, bú okenye, we jeso Sọl n'azu. 15 Ma Devid nējekuru Sọl, nēsi kwa n'ebe Sọl nọ laghachi, izù ìgwè ewu na aturu nna-ya na Bet-lehem. 16 Onye Filistia ahu nābiaru kwa nso n'isi-ututu na n'anyasi, we guzo onwe-ya ọgu abali abua. 17 Jesi we si Devid nwa-ya, Biko, wegara umu-nne-gi otù ephah nke ọka nka aṅara n'ọku, na ob͕e achicha iri ndia, būru ha b͕a ọsọ je n'ọmuma-ulo-ikwū jekuru umu-nne-gi; 18 buga-kwa-ra onye-isi usu nnù ndikom na ọgu ise nke ha cheese iri ndia, lekọta kwa umu-nne-gi ma ha nọ n'udo, nara kwa ihe-mbe-ha. 19 Ma Sọl, na ndi ahu, na ndikom nile nke Israel, nọ na ndagwurugwu Ila, nēbuso ndi Filistia agha. 20 Devid we bilie n'isi-ututu, rapu ìgwè ewu na aturu ahu n'aka onye nēdebe aturu, o we būru, je, dika Jesi nyere ya iwu: o we biarue ebe anēdebe ub͕ọ-ala, mb͕e usu-ndi-agha ndi nāpukuru usoro-agha nēti nkpu n'agha. 21 Israel na ndi Filistia we do onwe-ha n'usoro-agha izute usoro-agha. 22 Devid we zitu ihe nile o bu rapu n'aka onye nēdebe ihe, o we b͕abà n'usoro-agha, bia, jua umu-nne-ya ajuju bayere udo-ha. 23 Ma mb͕e ya na ha nēkwu okwu, le, onye-nputa-ọb͕ọ-agha ahu nēsi n'usoro-agha ndi Filistia rigota, bú onye Filistia ahu, Gọlaiat bu aha-ya, sitere na Gat, ọ we kwue dika okwu ndia si di: Devid we nu ha. 24 Ndikom nile nke Israel, mb͕e ha huru nwoke ahu, ha we b͕apu n'iru ya, tua egwu nke-uku. 25 Ndikom Israel we si, Ùnu ahuwo nwoke a nke nārigota? n'ihi na ọ bu ita Israel uta ka ọ nārigota: ọ gēru kwa, na nwoke nke nētib͕u ya, eze gēwere àkù uku me ka ọ buru ọgaranya, ọ gēnye kwa ya nwa-ya nwayi, me ka ulo nna-ya nwere onwe-ya n'Israel. 26 Devid we gwa ndikom ndi ya na ha nēguzo okwu, si, Gini ka agēmere nwoke nke gētib͕u onye Filistia nka, wezuga ihe-ita-uta n'aru Israel? n'ihi na ònye bu onye Filistia nka nke anēbìghi úgwù, na ọ gāta usoro-agha nile nke Chineke di ndu uta? 27 Ndi Israel we gwa ya okwu dika okwu a si di, si, Otú a ka agēmere nwoke nke gētib͕u ya. 28 Elaiab, bú nwa-nne-ya nke-okenye, we nu mb͕e ọ nāgwa ndikom ahu okwu; iwe Elaiab we di ọku megide Devid, ọ si, N'ìhi gini kwa ka i ridataworo? ọ̀ bu kwa n'aka onye ka i rapuru aturu ole-na-ole ahu n'ọzara? mu onwem mara nganga-gi, na ihe ọjọ nke obi-gi; n'ihi na ọ bu ihu agha ka i ridataworo. 29 Devid we si, Gini ka m'meworo ub͕u a? ọ̀ bughi okwu efu, bu ihe a m'nēkwu? 30 O we si n'akuku ya chigharia, che onye ọzọ iru, kwue dika okwu a si di: ndi Israel we zaghachi ya okwu dika okwu mbu si di. 31 Ewe nu okwu nke Devid kwuru, ha we gosi ha n'iru Sọl, o we nara ya. 32 Devid we si Sọl, Ka obi madu ọ bula ghara ifepu n'ihi ya; orù-gi gēje luso onye Filistia nka ọ̀gù. 33 Sọl we si Devid, I pughi ijekuru onye Filistia nka iluso ya ọ̀gù: n'ihi na nwata ka i bu, ma ya onwe-ya bu nwoke agha site na mb͕e ọ di na nwata. 34 Devid we si Sọl, Onye nāzùru nna-ya ìgwè ewu na aturu ka orù-gi buworo; ọdum we bia, ya na bear, we būpu nwa-aturu n'ìgwè aturu, 35 m'we pua so ya n'azu, tib͕ue ya, naputa nwa-aturu ahu n'ọnu-ya: o we bilie imegidem, m'we jide ya n'ọza-ya, tib͕ue ya, me ka ọ nwua. 36 Orù-gi tib͕uru ma ọdum ahu ma bear ahu: onye Filistia nka anēbìghi úgwù gādi kwa ka otù nime ha, n'ihi na ọ bu usoro-agha nile nke Chineke di ndu ka ọ taworo uta. 37 Devid we si, Jehova nke naputaram n'aka ọdum, na n'aka bear, Ya onwe-ya gānaputam n'aka onye Filistia nka. Sọl we si Devid, Je, Jehova gānọye-kwa-ra gi. 38 Sọl we yikwasi Devid uwe-nwuda-ya, kpukwasi okpu-agha ọla n'isi-ya, yikwasi ya uwe-agha. 39 Devid we kekwasi mma-agha-ya n'uwe-nwuda-ya, we jisie ike ije; n'ihi na ọ nwaghi ya. Devid we si Sọl, Apughm iwere ihe ndia je; n'ihi na anwaghm ha. Devid we yipu ha n'aru ya. 40 O were nkpa-n'aka-ya n'aka-ya, rọputara onwe-ya nkume ise kwọrọ murumuru na miri-iyi, tiye ha n'ihe ndi-ọzùzù-aturu nke o nwere, bú n'àkpà-ya; èbè-ya di kwa n'aka-ya: o we biarue nso onye Filistia ahu. 41 Onye Filistia ahu we bia, ọ nābia nēru kwa nso Devid; nwoke ahu nke nēbu ọta-ya nēje kwa n'iru ya. 42 Onye Filistia ahu we legide anya buruburu, hu Devid, we lelìa ya anya: n'ihi na ọ bu nwata, nācha kwa ọbara-ọbara, ma kwa nma ile anya. 43 Onye Filistia ahu we si Devid, Ọ̀ bu nkita ka m'bu, na gi onwe-gi nēwere nkpa-n'aka biakutem? Onye Filistia ahu we were chi-ya nile kọcha Devid. 44 Onye Filistia ahu we si Devid, Biakutem, ka m'were kwa anu-aru-gi nye anu-ufe nke elu-igwe na anumanu nke ọhia. 45 Devid we si onye Filistia ahu, Gi onwe-gi nēwere mma-agha, were kwa ube, were kwa nkpunkpu ube, biakutem: ma mu onwem nēwere aha Jehova nke usu nile nke ndi-agha biakute gi, bú Chineke nke usoro-agha nile nke Israel, Onye i taworo uta. 46 Ubọchi ta ka Jehova gēmechibido gi nye n'akam; m'gētib͕u kwa gi, wezuga isi-gi n'aru gi; m'gēwere kwa ozu ndi ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia nye anu-ufe nke elu-igwe, nye kwa anu-ọhia nke uwa ta; ka uwa nile we mara na Chineke diri Israel: 47 ya na ka nkpọkọta nka nile we mara na ọ bughi mma-agha na ube ka Jehova ji azọputa: n'ihi na Jehova nwe agha nka, Ọ gēnye kwa unu n'aka-ayi. 48 O rue, mb͕e onye Filistia ahu biliri, bia rue nso izute Devid, na Devid mere ngwa, b͕a ọsọ ijekuru usoro-agha izute onye Filistia ahu. 49 Devid we setia aka-ya tiye n'àkpà-ya, weputa otù nkume nime ya, ma ya, mata onye Filistia ahu n'egedege-iru-ya; nkume ahu we bamìe n'egedege-iru-ya, o we da kpue iru-ya n'ala. 50 Devid we were èbè, were kwa nkume, kwa onye Filistia n'ike, o we tib͕ue onye Filistia ahu, me ka ọ nwua; ma mma-agha adighi n'aka Devid. 51 Devid we b͕a ọsọ, guzo n'elu onye Filistia ahu, were mma-agha-ya, miputa ya n'ọbọ-ya, me ka ọ nwua, ọ were ya bipu isi-ya. Ndi Filistia we hu na dike-ha anwuwo, ha we b͕alaga. 52 Ndikom Israel na Juda we bilie, tie nkpu, chua ndi Filistia, rue ebe i nābà Gai, ru kwa ọnu-uzọ-ama Ekron. Ndi Filistia ndi emeruru aru we da n'uzọ Shaaraim, we rue Gat, ru kwa Ekron. 53 Umu Israel we si n'ichusi ndi Filistia ike lata, ha we kwakọrọ ọmuma-ulo-ikwū nile ha. 54 Devid we būru isi onye Filistia ahu, bubata ya na Jerusalem; ma ọ tọb͕ọrọ ihe-agha-ya n'ulo-ikwū-ya. 55 Ma mb͕e Sọl huru Devid ka ọ nāpu izute onye Filistia ahu, ọ siri Abnea, bú onye-isi usu-ndi-agha-ya, Abnea, nwà onye ka nwa-okoro nka bu? Abnea we si, Nkpuru-obi-gi nādi ndu, eze, amaghm. 56 Eze we si, Gi onwe-gi juta onye nwata-okorọbia ahu bu nwa-ya. 57 Ma mb͕e Devid si na ntib͕u onye Filistia ahu lata, Abnea kuru ya, me ka ọ bata n'iru Sọl, isi onye Filistia ahu di kwa n'aka-ya. 58 Sọl we si ya, Nwà onye ka i bu, gi nwa-okorọbia? Devid we si, Nwa orù-gi, bú Jesi, bú onye Bet-lehem, ka m'bu.

1 Samuel 18

1 O rue, mb͕e ọ gwabìri Sọl okwu, na ekekọtara nkpuru-obi Jonatan na nkpuru-obi Devid, Jonatan we hu ya n'anya dika nkpuru-obi-ya. 2 Sọl we nara ya n'ubọchi ahu, o kweghi kwa ka ọ laghachi n'ulo nna-ya. 3 Jonatan na Devid we b͕a ndu, n'ihi na ọ huru ya n'anya dika nkpuru-obi-ya. 4 Jonatan we yipu uwe-nwuda nke di n'aru ya, nye ya Devid, na uwe-ya nile, ọbuná rue mma-agha-ya, ru kwa uta-ya, ru kwa ihe-ike-n'úkwù-ya. 5 Devid we nāpu je ebe ọ bula Sọl nēziga ya, o nwe-kwa-ra uche: Sọl we do ya onye-isi ndikom agha, o we di nma n'anya ndi Israel nile, di kwa nma n'anya ndi-orù Sọl. 6 O rue mb͕e ha nābia, mb͕e Devid si na ntib͕u onye Filistia ahu lata, na ndinyom siri n'obobo nile nke Israel puta, ibù abù na ite egwú, izute Sọl, chiri egwú-otiti, were kwa ọṅu, chiri kwa ubọ eji akwara atọ kwe. 7 Ndinyom we zarita onwe-ha, bú ndi nēgwuri egwú, si, Sọl etib͕uwo ndi-iro-ya, nnù ndikom abua na ọgu iri, nnù ndikom abua na ọgu iri, Devid kwa ndi-iro-ya, orú nnù ndikom na nnù ise, orú nnù ndikom na nnù ise. 8 Iwe Sọl we di ọku nke-uku, okwu a jọ-kwa-ra njọ n'anya-ya; ọ si, Ha enyewo Devid orú nnù na nnù ise, orú nnù na nnù ise, ma ọ bu mu ka ha nyeworo nání nnù abua na ọgu iri, nnù abua na ọgu iri: ma nke fọduru inye ya bu nání ala-eze. 9 Sọl we nēle Devid anya ọjọ site n'ubọchi ahu ga n'iru. 10 O rue, n'echi-ya, na mọ ọjọ nke Chineke dakwasiri Sọl n'ike, o we bū amuma n'etiti ulo: Devid nēwere kwa aka-ya kpọ ubọ, dika ọ nēme kwa-ubọchi: ma ube di n'aka Sọl. 11 Sọl we tua ube ahu; ọ si, M'gātugide Devid ọbuná na mb͕idi. Devid we chigharia onwe-ya si n'iru ya pua ub͕ò abua. 12 Sọl we nātu egwu Devid, n'ihi na Jehova nọyere ya, ma O siri n'ebe Sọl nọ wezuga Onwe-ya. 13 Sọl we si n'ebe ọ nọ wezuga ya, do ya ka ọ buru ya onye-isi nnù ndikom abua na ọgu iri; o we nāpu nābata kwa n'iru ndi Israel. 14 Devid we nēnwe uche n'uzọ-ya nile; Jehova nọye-kwa-ra ya. 15 Sọl we hu na nwoke ahu bu onye nēnwe uche nke-uku, o we tua ujọ ya. 16 Ma Israel nile na Juda nile nāhu Devid n'anya; n'ihi na ya onwe-ya nāpu nābata kwa n'iru ha. 17 Sọl we si Devid, Le, adam, bú Mirab, ya ka m'gēnye gi na nwunye: nání burum dìnkpà, bū kwa agha nile nke Jehova. N'ihi na Sọl siri, Ka akam ghara idi n'aru ya, kama ka aka ndi Filistia di n'aru ya. 18 Devid we si Sọl, Ònye ka m'bu, gini bu kwa ndum, ma-ọbu ab͕uru nnam n'Israel, na m'gāburu eze di nwa-ya? 19 O rue, na mb͕e agēwere Mirab nwa Sọl nye Devid, na nwayi ahu ka enyere Adriel, bú onye Mehola, na nwunye. 20 Ma Maikal, bú nwa-nwayi Sọl, huru Devid n'anya: ha we gosi Sọl, ihe ahu ziri ezi n'anya-ya. 21 Sọl we si, M'gēnye ya ya, ka o we ghọrọ ya ọnyà, ka aka ndi Filistia we di n'aru ya. Sọl we si Devid, Nke ub͕ò abua ka i gāburum di nwam ta. 22 Sọl we nye ndi-orù-ya iwu, si, Gwanu Devid okwu na nzuzo, si, Le, ihe-gi nātọ eze utọ, ndi-orù-ya nile hu-kwa-ra gi n'anya: ma ub͕u a buru di nwa eze. 23 Ndi-orù Sọl we kwue okwu ndia na nti Devid. Devid we si, Ọ̀ bu ihe di nfe n'anya-unu ibu di nwa eze, ebe mu onwem bu ob͕eye na onye anākpọghi ihe? 24 Ndi-orù Sọl we gosi ya, si, Dika okwu ndia si di ka Devid kwuru. 25 Sọl we si, Otú a ka unu gāsi Devid, Ọ dighi ego-ilu-nwunye gātọ eze utọ, kama ọgu api ise nke ndi Filistia, ka o we bọrọ onwe-ya ọ́bọ̀ n'aru ndi-iro eze. Ma Sọl chère ime ka Devid da ada n'aka ndi Filistia. 26 Ndi-orù-ya we gosi Devid okwu ndia, ma ihe ahu ziri ezi n'anya Devid, bú ka ọ buru di nwa eze. Ma ubọchi nile akēzughi; 27 Devid we bilie, je, ya onwe-ya na ndikom-ya, o we tib͕ue ọgu ndikom iri n'etiti ndi Filistia; Devid we chita api-ha, ha we nye ha eze n'ọnu-ọgugu zuru ezu, ka o we buru di nwa eze. Sọl we nye ya Maikal nwa-ya na nwunye. 28 Sọl we hu mara kwa na Jehova nọyere Devid; Maikal nwa Sọl hu-kwa-ra ya n'anya. 29 Sọl we nātu egwu Devid kari; Sọl we buru onye-iro Devid ubọchi-ya nile. 30 Ndi-isi ndi Filistia we puta: o rue, mb͕e ọ bula ha nāputa, na Devid nwere uche kari ndi-orù nile nke Sọl; aha-ya we di oké ọnu-ahia nke-uku.

1 Samuel 19

1 Sọl we gwa Jonatan nwa-ya na ndi-orù-ya nile okwu, ka ha me ka Devid nwua. 2 Ma ihe Devid tọrọ Jonatan nwa Sọl utọ nke-uku. Jonatan we gosi Devid, si, Sọl, bú nnam, nāchọ ime ka i nwua: ma ub͕u a, biko, lezie onwe-gi anya n'ututu, nọdu n'ebe di nzuzo, zo onwe-gi: 3 ma mu onwem gāpu, guzo n'akuku nnam n'ọhia ebe gi onwe-gi nọ, mu onwem gāgwa kwa nnam okwu bayere gi; ma m'hu ihe ọ bula, m'gēgosi kwa gi. 4 Jonatan we gwa Sọl nna-ya okwu di nma bayere Devid, si ya, Ka eze ghara imehie megide orù-ya, bú Devid; n'ihi na o mehieghi megide gi, na n'ihi na omume-ya nile adiwo nma nke-uku n'ebe i nọ: 5 n'ihi na o tiyere ndu-ya n'ọbu-aka-ya, tib͕ue onye Filistia ahu, Jehova we zọputa nzọputa uku bayere Israel nile: i huru ya anya, we ṅuria ọṅu: n'ìhi gini kwa ka i gēmehie megide ọbara nēmeghi ihe ọjọ, ime ka Devid nwua n'efu? 6 Sọl we ge nti olu Jonatan: Sọl we ṅua iyi, si, Jehova nādi ndu, agaghi-eme ka ọ nwua ma-ọli. 7 Jonatan we kpọ Devid, Jonatan we gosi ya ihe ndia nile. Jonatan we me ka Devid biakute Sọl, o we nọ n'iru ya, dika na mb͕e gara aga. 8 Agha we di kwa ọzọ: Devid we pua, buso ndi Filistia agha, tib͕ue ha ntib͕u uku; ha we b͕apu n'iru ya. 9 Mọ ọjọ nke Jehova we di n'aru Sọl, ma ya onwe-ya nānọdu n'ulo-ya, ube-ya di kwa n'aka-ya; Devid we were aka-ya nākpọ ubọ. 10 Sọl we chọ iwere ube ahu tugide Devid ọbuná na mb͕idi; ma o repuru n'iru Sọl, ọ we tugide ube ahu na mb͕idi: Devid we b͕alaga, wepuga onwe-ya n'abali ahu. 11 Sọl we ziga ndi-ozi n'ulo Devid, iche ya nche, na ime ka ọ nwua n'ututu: Maikal, bú nwunye-ya, we gosi Devid, si, Ọ buru na i zọputaghi ndu-gi abali a, agēme ka gi onwe-gi nwua echi. 12 Maikal we weda Devid site na window: o we je, b͕alaga, wepuga onwe-ya. 13 Maikal we were terafim-ya, tọb͕ọ ya n'ihe-ndina-ya, tiye ákwà-ob͕ub͕o eji aji ewu me n'okpuru isi-ya, were ákwà-nb͕okwasi kpuchie ya. 14 Sọl we ziga ndi-ozi iwere Devid, ma Maikal siri, Aru adighi ya ike. 15 Sọl we ziga ndi-ozi ahu ihu Devid, si, Bugotaram ya n'ihe-ndina-ya, ka m'we me ka ọ nwua. 16 Ndi-ozi ahu we bata, ma, le, terafim ahu di n'ihe-ndina, ákwà-ob͕ub͕o nke eji aji ewu me di kwa n'okpuru isi-ya. 17 Sọl we si Maikal, N'ìhi gini ka i ghọb͕uworom otú a, we zilaga onye-irom, o we wepuga onwe-ya? Maikal we si Sọl, Ya onwe-ya sirim, Zilagam: n'ìhi gini ka m'gēme ka i nwua? 18 Ma Devid b͕alagara, wepuga onwe-ya, biakute Samuel rue Rema, gosi ya ihe nile Sọl mere ya. Ọ we je, ya onwe-ya na Samuel, ha we biri na Naiot. 19 Ewe gosi Sọl, si, Le, Devid nọ na Naiot nime Rema. 20 Sọl we ziga ndi-ozi iwere Devid: ha we hu nzukọ ndi-amuma ahu ka ha nēbu amuma, ha hu kwa Samuel ka ọ nēguzo, dika onye-isi-ha: Mọ nke Chineke we dikwasi ndi-ozi Sọl, ha onwe-ha we bū kwa amuma. 21 Ha we gosi Sọl, o we ziga ndi-ozi ọzọ, ha onwe-ha we bū kwa amuma. Sọl we ziga kwa ndi-ozi ọzọ nke ub͕ò atọ, ha onwe-ha we bū kwa amuma. 22 Ya onwe-ya we je kwa Rema, biarue olùlù-miri uku nke di na Seku: ọ jua, si, Òle ebe Samuel na Devid nọ? Otù onye we si, Le, ha nọ na Naiot nime Rema. 23 O we je n'ebe ahu, rue Naiot nime Rema: Mọ nke Chineke we dikwasi kwa ya, o we nēje, we bue amuma, rue mb͕e ọ batara Naiot nime Rema. 24 Ya onwe-ya we yipu kwa uwe-ya nile, ya onwe-ya we bū kwa amuma n'iru Samuel, da n'ala b͕ara ọtọ ubọchi ahu nile na abali-ya nile. N'ihi ya ka ha nāsi, Sọl, ọ̀ di kwa n'etiti ndi-amuma?

1 Samuel 20

1 Devid we si na Naiot nime Rema b͕alaga, ọ bia kwue n'iru Jonatan, si, Gini ka m'meworo? gini bu ajọ omumem? gini bu kwa nmehiem n'iru nna-gi, na ọ nāchọ ndum? 2 Ọ si ya, Ya buru ihe-árú; i gaghi-anwu: le, nnam adighi-eme ihe uku ma-ọbu ihe ntà, ma ọ buru na o kpughepughi ntim ka m'nu ya: gini me-kwa-ra nnam ji zonarim ihe a? ọ bughi otú a. 3 Devid we ṅua iyi ọzọ, si, Nna-gi amawo nke-ọma na ahutawom amara n'iru gi; o we si, Ka Jonatan ghara ima nka, ka o we ghara iwuta ya: ma otú ọ di, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, nání ihe ra ka otù nzọ-ukwu di n'ab͕ata mu na ọnwu. 4 Jonatan we si Devid, Gini ka nkpuru-obi-gi nāsi? m'gēme-kwa-ra gi ya. 5 Devid we si Jonatan, Le, ọnwa ọhu gāpu echi, mu onwem aghaghi kwa iso eze nọdu n'iri ihe: ma zilagam, ka m'we zo onwem n'ọhia rue anyasi nwa-nne-echi. 6 Ọ buru na nna-gi ele anyam ma-ọli, i gāsi kwa, Devid riọsirim ike ka m'rapu ya ka ọ b͕a ọsọ je Bet-lehem, bú obodo-ya: n'ihi na àjà arọ diri ab͕uru-ya nile n'ebe ahu. 7 Ọ buru na ọ si otú a, Ọ di nma; udo gādiri orù-gi: ma ọ buru na iwe-ya di ọku nke-uku, mara na o zubesiri ihe ọjọ a ike. 8 Ma i gēmere orù-gi ebere; n'ihi na i mere ka orù-gi soro gi ba n'ọb͕ub͕a-ndu Jehova: ma ọ buru na ajọ omume di nimem, gi onwe-gi me ka m'nwua; ma n'ìhi gini kwa ka i gēme ka m'bakuru nna-gi? 9 Jonatan we si, Ya buru gi ihe-árú: n'ihi na ọ buru na amaram n'ezie na nnam zubesiri ike ka ihe ọjọ a biakwasi gi, #m'gaghi-egosi kwa gi ya? 10 Devid we si Jonatan, Ònye gēgosim? ma-ọbu gini gēme ma ọ buru na nna-gi aza gi okwu ike? 11 Jonatan we si Devid, Bia, ka ayi pua je n'ọhia. Ha abua we pua je n'ọhia. 12 Jonatan we si Devid, Jehova, bú Chineke Israel, Ya buru onye-àmà; mb͕e m'gēnyochata obi nnam dika mb͕e a echi, ma-ọbu nwa-nne-echi, ma, le, ọ di nma n'ebe Devid nọ, #m'gaghi-ezite-kwa-ra gi ozi, we kpughepu nti-gi ka i nu ya? 13 Jehova me Jonatan otú a, me kwa ya ihe ọzọ otú a, mb͕e ọ di nnam nma ime gi ihe ọjọ a, ma m'kpughepughi nti-gi ka i nu ya, we zilaga gi, ka i we la n'udo: Jehova nọye-kwa-ra gi, dika Ọ nọyeworo nnam. 14 Ma ọ bughi nání mb͕e m'nọ na ndu ka i gēmerem ebere nke Jehova, ka m'we ghara inwu: 15 kama i gaghi-ebipu kwa ebere-gi n'ulom rue mb͕e ebighi-ebi: i gaghi-ebipu kwa ya mb͕e Jehova bipuworo ndi-iro Devid, nwoke ọ bula n'elu uwa. 16 Jonatan na ulo Devid we b͕a ndu, si, Jehova gājuta ya n'aka ndi-iro Devid. 17 Jonatan we me kwa ka Devid ṅua iyi ọzọ, n'ihi na ọ huru ya n'anya: n'ihi na dika ọ huru nkpuru-obi nke onwe-ya n'anya, otú a ka ọ huru Devid n'anya. 18 Jonatan we si ya, Echi ka ọnwa ọhu gāpu: agēle kwa anya gi, n'ihi na agēle anya ọnọdu-gi nke tọb͕ọrọ n'efu. 19 Ma mb͕e i nọdusiri ubọchi atọ i garida ọsọsọ, ba n'ebe ahu, bú ebe izoro onwe-gi n'ubọchi ihe ahu emere, i gānọdu kwa n'akuku nkume Ezel. 20 Mu onwem gāb͕a kwa àkú atọ n'akuku-ya, dika agāsi na ab͕aram ihe m'dotara. 21 Ma, le, m'gēziga nwa-okorom, si, Je, chọta àkú nile. Ọ buru na asim nwa-okoro ahu ma-ọli, Le, àkú di n'akuku azu gi: chiri ha bia; n'ihi na udo diri gi, okwu adighi kwa, Jehova nādi ndu. 22 Ma ọ buru na asim nwata-okorọbia ahu otú a, Le, àkú di n'akuku iru gi: la; n'ihi na Jehova ezilagawo gi. 23 Ma okwu ahu nke mu na gi kwuworo, le, Jehova nọ n'etiti mu na gi rue mb͕e ebighi-ebi. 24 Devid we zo onwe-ya n'ọhia: ubọchi ọnwa ọhu we rue, eze we nọdu na nri iri ihe. 25 Eze we nọkwasi n'ọnọdu-ya, dika ọ nēme ub͕ò ub͕ò, bú n'ọnọdu di n'akuku mb͕idi; Jonatan we bilie, Abnea we nọdu n'akuku Sọl: ma elere anya ọnọdu Devid nke tọb͕ọrọ n'efu. 26 Ma Sọl ekwughi ihe ọ bula n'ubọchi ahu: n'ihi na ọ siri, Ihe-ndabà ka ọ bu; onye nādighi ọcha ka ọ bu; n'ezie ọ dighi ọcha. 27 O rue n'echi nke ọnwa ọhu, nke bu ubọchi nke-abua, na elere anya ọnọdu Devid nke tọb͕ọrọ n'efu: Sọl we si Jonatan nwa-ya, Gini mere nwa Jesi abataghi iri nri ma nyahuru ma ta? 28 Jonatan we za Sọl, si, Devid riọsirim ike ka m'rapu ya ka ọ je na Bet-lehem: 29 ọ si, Biko, zilagam; n'ihi na àjà ab͕uru-ayi ka ayi nwere n'obodo; ya onwe-ya enyewom iwu, bú nwa-nnem, ije: ma ub͕u a, ọ buru na ahutawom amara n'iru gi, biko, ka m'wepuga onwem, we hu umu-nnem. N'ihi ya ọ biaghi na table eze. 30 Iwe Sọl we di ọku megide Jonatan, ọ si ya, Gi nwa nke nwayi b͕agọrọ ab͕agọ nke nānupu kwa isi, àmaghm na gi onwe-gi nārọputa nwa Jesi ibu ihe-ihere-gi na ibu ihe-ihere ọtọ nne-gi? 31 N'ihi na ubọchi nile nwa Jesi di ndu n'elu ala, agaghi-eme ka gi onwe-gi ma-ọbu ala-eze-gi guzosie ike. Ma ub͕u a ziga kutaram ya, n'ihi na onye kwesiri ọnwu ka ọ bu. 32 Jonatan we za Sọl nna-ya, si ya, N'ìhi gini ka agēme ka ọ nwua? Gini ka o meworo? 33 Sọl we tua ya ube-ya itub͕u ya: Jonatan we mara na nna-ya zubesiri ihe ahu ike, bú ime ka Devid nwua. 34 Jonatan we si na table bilie n'iwe di ọku, o righi kwa nri n'ubọchi nke-abua nke ọnwa ahu: n'ihi na o wutara ya n'ihi Devid, n'ihi na nna-ya mere ya ihe-ihere. 35 O rue, n'ututu, na Jonatan puru je n'ọhia na mb͕e ya na Devid kara àkà, otù nwatakiri-nwoke so kwa ya. 36 Ọ si nwa-okoro-ya, B͕a ọsọ, biko chọta àkú nile nke mu onwem nāb͕a. Mb͕e nwa-okoro ahu nāb͕a ọsọ, ya onwe-ya we b͕a àkú, me ka ọ gabiga ya. 37 Nwa-okoro ahu we biarue ebe àkú ahu di, bú nke Jonatan b͕ara, Jonatan we kpọ òkù n'azu nwa-okoro ahu, si, Àkú ahu, ọ̀ dighi n'akuku iru gi? 38 Jonatan we kpọ òkù n'azu nwa-okoro ahu, si, Me ngwa, je ọsọsọ, eguzola. Nwa-okoro Jonatan we chikọta àkú, biakute onye-nwe-ya. 39 Ma nwa-okoro ahu amaghi ihe ọ bula: nání Jonatan na Devid mara okwu ahu. 40 Jonatan we nye nwa-okoro o nwere ihe-ya, si ya, La, chiri ha ba n'obodo. 41 Mb͕e nwa-okoro ahu basiri n'obodo, Devid we si n'akuku Negeb bilie, da kpue iru-ya n'ala, kpọ isi ala ub͕ò atọ: ha we suturita onwe-ha ọnu, kwaritara onwe-ha ákwá, rue mb͕e Devid kwakariri ákwá. 42 Jonatan we si Devid, La n'udo, n'ihi na ayi aṅuwo iyi, ayi abua, n'aha Jehova, si, Jehova gānọ n'etiti mu na gi, na n'etiti nkpurum na nkpuru-gi, rue mb͕e ebighi-ebi. O we bilie, la: Jonatan we ba n'obodo.

1 Samuel 21

1 Devid we biarue Nob biakute Ahimelek, bú onye-nchu-àjà: Ahimelek we ma jijiji izute Devid, si ya Gini mere nání gi onwe-gi biara, ma ọ dighi nwoke gi na ya yikọrọ? 2 Devid we si Ahimelek, bú onye-nchu-àjà, Eze enyewom ihe n'iwu, sim, Ka nwoke ọ bula ghara ima ihe ọ bula bayere ihe ahu nke mu onwem nēziga gi ozi-ya, na nke m'nyeworo gi n'iwu: emewokwam ka umu-okorọbiam mara na ha gēje n'ebe di otú a otú a. 3 Ma ub͕u a gini di n'okpuru aka-gi? nyem ob͕e achicha ise n'aka, ma-ọbu ihe agāchọta. 4 Onye-nchu-àjà ahu we za Devid, si, Ọ dighi achicha anēdoghi nsọ di n'okpuru akam, ma achicha nsọ di; nání ọ buru na umu-okorọbia ahu edebewo onwe-ha ghara imetu nwayi aru. 5 Devid we za onye-nchu-àjà, si ya, N'ezie, ọ buru na eb͕ochiwo ndinyom n'imetu ayi aru, dika na mb͕e gara aga mb͕e m'nāputa, ihe umu-okorọbia we di nsọ, ma nke ahu bu ije nke anēdoghi nsọ; ìhe-ha gēsi kwa aṅa ghara idi nsọ kari ta? 6 Onye-nchu-àjà we nye ya achicha nsọ: n'ihi na ọ dighi achicha di n'ebe ahu ma-ọbughi achicha nke iru Chineke, nke anēwezuga n'iru Jehova, idọba achicha di ọku n'elu table n'ubọchi ewepuru ya. 7 Ma otù nwoke n'etiti ndi-orù Sọl nọ n'ebe ahu n'ubọchi ahu, onye anēb͕ochi ka ọ ghara ipu n'iru Jehova; aha-ya bu Doeg, onye Edom, onye kachasi ike n'etiti ndi-ọzùzù anu-ulo ndi Sọl nwere. 8 Devid we si Ahimelek, Ọ̀ dighi kwa ube ma-ọbu mma-agha di n'ebe a n'okpuru aka-gi? n'ihi na ewetaghm ma mma-agham ma ihe-agham, n'ihi na okwu a nke eze bu ihe di ọku ọku. 9 Onye-nchu-àjà we si, Mma-agha Gọlaiat, bú onye Filistia, onye i tib͕uru na ndagwurugwu Ila, le, nke ahu di, afuchiworo ya n'ákwà n'azu ephod: ọ buru na i gēwere nke ahu, were ya: n'ihi na ọ dighi ọzọ di n'ebe a ma-ọbughi ya. Devid we si, Ọ dighi nke di ka ya; nyem ya. 10 Devid we bilie, b͕apu n'ubọchi ahu n'iru Sọl, bakuru Ekish, bú eze Gat. 11 Ndi-orù Ekish we si ya, Ọ̀ bughi Devid, bú eze ala ahu, bu nka? ọ̀ bughi ihe bayere nwoke a ka ha zaritara onwe-ha n'ite-egwú, si, Sọl etib͕uwo ndi-iro-ya, nnù ndikom abua na ọgu iri, nnù ndikom abua na ọgu iri, Devid kwa ndi-iro-ya, orú nnù ndikom na nnù ise, orú nnù ndikom na nnù ise? 12 Devid we tiye okwu ndia n'obi-ya, tua egwu Ekish, bú eze Gat, nke-uku. 13 O we b͕anwe omume-ya n'anya-ha, me onwe-ya dika onye anya-ya nādighi nma n'aka-ha, ọ ka kwa akàrà n'ibo ọnu-uzọ-ama, nāgusisi kwa ọnu-miri-ya n'afu-ọnu-ya. 14 Ekish we si ndi-orù-ya, Le, unu nāhu nwoke a ka o nēme onwe-ya dika onye nāwi ara: n'ìhi gini ka unu mere ka ọ biakutem? 15 Ndi nke akam nāwi ara, hà kọrọm ukọ, na unu emewo ka nwoke a bata ime onwe-ya dika onye nāwi ara n'irum? Nwoke a, ọ̀ gābata n'ulom?

1 Samuel 22

1 Devid we si n'ebe ahu je, wepuga onwe-ya rue ọb͕à Adulam: umu-nne-ya na ulo nna-ya nile we nu ya, ha we ridakuru ya n'ebe ahu. 2 Ha we chikọta onwe-ha n'ebe ọ nọ, bú nwoke ọ bula nke nọ na nkpab͕u, na nwoke ọ bula nke nwere onye ọ nara ego n'ọmuru-nwa, na nwoke ọ bula nkpuru-obi-ya di ilu; o we buru onye-isi-ha: ihe ra ka nnù ndikom we nọ n'aka-ya. 3 Devid we si n'ebe ahu je rue Mizpe Moab: ọ si eze Moab, Biko, ka nnam na nnem puta, nọ n'etiti unu, rue mb͕e m'mara ihe Chineke gēmerem. 4 O we duru ha bia n'iru eze Moab: ha we biri n'aka-ya ubọchi nile Devid nọ n'ebe ahu ewusiri ike. 5 Gad, bú onye-amuma, we si Devid, Anọdula n'ebe a ewusiri ike; je, bara onwe-gi n'ala Juda. Devid we je, ba n'oké ọhia Heret. 6 Sọl we nu na amatara ihe bayere Devid na ndikom ya na ha nọ: ma Sọl nānọdu na Gibea, n'okpuru osisi tamarisk na Rema, ube-ya di kwa n'aka-ya, ndi-orù-ya nile nēguzo n'akuku ya. 7 Sọl we si ndi-orù-ya ndi nēguzo n'akuku ya, Biko, nurunu, unu ndi Benjamin; ọ̀ bu kwa unu nile ka nwa Jesi gēnye ubi na ubi-vine, ọ̀ bu unu nile ka ọ gēdo ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri na ndi-isi usu ọgu ndikom ise? 8 na unu nile ekekọtawo onwe-unu imegidem, ọ dighi kwa onye nēkpughepu ntim ka m'nu ya mb͕e nwam na nwa Jesi b͕ara ndu, ọ dighi kwa onye nime unu ọ nēb͕u nb͕u n'obi n'ihim, ma-ọbu nke nēkpughepu ntim ka m'nu na nwam emewo ka orùm bilie imegidem, iche anwu, dika ta. 9 Doeg onye Edom we za, (n'ihi na ya onwe-ya nēguzo n'akuku ndi-orù Sọl), si, Ahurum nwa Jesi ka ọ nābiaru Nob, biakute Ahimelek nwa Ahaitub. 10 O we juara ya ase n'aka Jehova, nye ya ihe ọ gēri n'uzọ, nye kwa ya mma-agha Gọlaiat onye Filistia. 11 Eze we ziga ikpọ Ahimelek nwa Ahaitub, bú onye-nchu-aja, na ulo nna-ya nile, bú ndi-nchu-àjà ndi nọ na Nob: ha we biakute eze, ha nile. 12 Sọl we si, Biko, nuru, gi nwa Ahaitub. O we si, Lem, onye-nwem. 13 Sọl we si ya, N'ìhi gini ka unu kekọtaworo onwe-unu imegidem, gi onwe-gi na nwa Jesi, n'inye ya achicha na mma-agha, na n'ijuru ya ase n'aka Chineke, ka o we bilie imegidem, iche anwu, dika ta? 14 Ahimelek we za eze, si, Ònye kwa n'etiti orù-gi nile di ka Devid? ọ bu onye kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa di nwa eze, o wezugawo kwa onwe-ya ibà n'etiti ndi nānu okwu-gi, ọ di kwa nsọpuru n'ulo-gi. 15 Ọ̀ bu ta ka m'malitere ijuru ya ase n'aka Chineke? ya burum ihe-árú: ka eze ghara ibo orù-ya ebubo ọ bula, ghara kwa ibo ulo nnam nile: n'ihi na orù-gi amaghi ihe ọ bula n'ihe a nile, nke di ntà ma-ọbu nke di uku. 16 Eze we si, I ghaghi inwu, Ahimelek, gi onwe-gi na ulo nna-gi nile. 17 Eze we si ndi-ọb͕a-ọsọ ndi nēguzo n'akuku ya, Chigharianu, me ka ndi-nchu-àjà Jehova nwua; n'ihi na aka-ha di kwa n'akuku Devid, na n'ihi na ha mara na onye nāb͕apu ka ọ bu, ma ha ekpughepughi ntim ka m'nu ya. Ma ndi-orù eze ekweghi isetipu aka-ha idakwasi ndi-nchu-àjà Jehova. 18 Eze we si Doeg, Gi onwe-gi chigharia, dakwasi ndi-nchu-àjà. Doeg onye Edom we chigharia, ya onwe-ya we dakwasi ndi-nchu-àjà, me ka ọgu ndikom anọ na ise nwua n'ubọchi ahu, bú ndi nēyi ephod nke ákwà ọcha. 19 O were kwa ọnu mma-agha tib͕ue Nob, bú obodo ndi-nchu-àjà, were ọnu mma-agha tib͕ue ma nwoke ma nwayi, ma nwatakiri ma nwa nāṅu ara, na ehi na inyinya-ibu na aturu. 20 Ma otù nwa-nwoke nke Ahimelek nwa Ahaitub nwere, aha-ya bu Abaiata, wepugara onwe-ya, b͕apu soro Devid. 21 Abaiata we gosi Devid na Sọl eb͕uwo ndi-nchu-àjà Jehova. 22 Devid we si Abaiata, Amaram n'ubọchi ahu, mb͕e Doeg, bú onye Edom, nọ n'ebe ahu, na ọ ghaghi igosi Sọl: mu onwem akpatawo ọnwu nke madu nile nke ulo nna-gi. 23 Ka mu na gi nọdu, atula egwu; n'ihi na onye ahu nke nāchọ ndum nāchọ ndu-gi: n'ihi na ihe-ndebe ka i bu n'akam.

1 Samuel 23

1 Ha we gosi Devid, si, Le, ndi Filistia nēbuso Keila agha, ndi ahu nāpunara ha ebe-nzọcha-ọka nile ha. 2 Devid we jua Jehova ase, si, M'gēje tib͕ue ndi Filistia ndia? Jehova we si Devid, Je, tib͕ue ndi Filistia, zọputa Keila. 3 Ndikom Devid we si ya, Le, ayi onwe-ayi nātu egwu n'ebe a nime Juda: àyi gēsi kwa aṅa ghara itu egwu kari mb͕e ayi gēje Keila, rue usoro-agha nile nke ndi Filistia? 4 Devid we ju kwa Jehova ase ọzọ. Jehova we za ya, si, Bilie, rida rue Keila; n'ihi na Mu onwem nēnye ndi Filistia n'aka-gi, 5 Devid na ndikom-ya we jerue Keila, buso ndi Filistia agha, kpuru anu-ulo-ha, tib͕ue ha ntib͕u uku. Devid we zọputa ndi bi na Keila. 6 O rue, mb͕e Abaiata nwa Ahimelek b͕akuru Devid rue Keila, na ọ chiri ephod n'aka-ya rida. 7 Ewe gosi Sọl na Devid abàwo na Keila. Sọl we si, Chineke ajuwo ya, rapu ya n'akam; n'ihi na emechibidowo ya nime, n'ibà n'obodo nwere ibo ọnu-uzọ-ama na nkpọrọ. 8 Sọl we me ka ndi Israel nile nuru na ha gēje agha, iridaru Keila, inọchigide Devid na ndikom-ya n'agha. 9 Devid we mara na ọ bu ya ka Sọl nēcheputa ihe ọjọ megide; o we si Abaiata, bú onye-nchu-àjà, Chita ephod nso. 10 Devid we si, Jehova, bú Chineke Israel, orù-Gi anuwo n'ezie na Sọl nāchọ ibiaru Keila, ibibi obodo a n'ihim. 11 Ndi-nwe Keila, ha gēmechibidom nye n'aka-ya? Sọl, ọ̀ gāridata, dika orù-Gi nuworo? Jehova, bú Chineke Israel, biko, gosi orù-Gi. Jehova we si, Ọ gāridata. 12 Devid we si, Ndi-nwe Keila, hà gēmechibidom na ndikom nkem nye n'aka Sọl? Jehova we si, Ha gēmechibido gi nye. 13 Devid na ndikom-ya, ihe ra ka nnù ndikom na ọgu iri, we bilie, si na Keila pua, ha we nējeghari ebe ha huru uzọ ijeghari. Ewe gosi Sọl na Devid esiwo na Keila wepuga onwe-ya; o we ghara iputa. 14 Devid we nọdu n'ọzara n'ebe ewusiri ike, o we nọdu n'ugwu n'ọzara Zif. Sọl we nāchọ ya ubọchi nile, ma Chineke enyeghi ya n'aka-ya. 15 Devid we hu na Sọl aputawo ichọ ndu-ya: ma Devid nọ n'ọzara Zif n'oké ọhia. 16 Jonatan nwa Sọl we bilie, jekuru Devid n'oké ọhia ahu, me ka aka-ya di ike nime Chineke. 17 Ọ si ya, Atula egwu: n'ihi na aka nnam, bú Sọl, agaghi-achọta gi; gi onwe-gi gābu kwa eze Israel, mu onwem gābu-kwa-ra gi onye nke-abua; ọzọ kwa, Sọl, bú nnam, mara nka. 18 Ha abua we b͕a ndu n'iru Jehova: Devid we nọdu n'oké ọhia, ma Jonatan lara n'ulo-ya. 19 Ndi Zif we rigokuru Sọl rue Gibea, si, Devid, ò zoghi onwe-ya n'etiti ayi n'ebe ewusiri ike n'oké ọhia, n'ugwu ntà Hakila, nke di na Ndida nke ala ahu nke tọb͕ọrọ n'efu? 20 Ma ub͕u a, eze, dika agu nile nke nāgu nkpuru-obi-gi iridata si di, ridata; ọ diri ayi imechibido ya nye n'aka eze. 21 Sọl we si, Ndi agọziri agọzi diri Jehova ka unu bu; n'ihi na unu enwewo ọmiko n'arum. 22 Biko, lanu, dozi-kwa-nu ọzọ, mára hu kwa ọnọdu-ya ebe ukwu-ya di, na onye huworo ya n'ebe ahu: n'ihi na agwawom na ya onwe-ya nāghọ aghughọ nke-uku. 23 Ma hunu, we mara ebe-izo-nzuzo nile ebe o nēzo onwe-ya, unu biaghachikutekwam mb͕e unu dozisiri onwe-unu, m'gēso kwa unu je: o gēru kwa, ọ buru na ọ nọ n'ala nka, na m'gāchọputa ya n'usu nnù ndikom Juda abua na ọgu iri nile. 24 Ha we bilie, jerue Zif n'iru Sọl: ma Devid na ndikom-ya di n'ọzara Maon, n'Araba, na Ndida nke ala ahu tọb͕ọrọ n'efu. 25 Sọl na ndikom-ya we je ichọ ya. Ha we gosi Devid: o we rida rue nkume ahu di elu, nọdu n'ọzara Maon. Sọl we nu ya, chua Devid n'azu n'ọzara Maon. 26 Sọl we je n'otù akuku ugwu, Devid na ndikom-ya n'akuku nke-ọzọ nke ugwu ahu: Devid we zọlie ọsọsọ ib͕apu n'iru Sọl; ma Sọl na ndikom-ya nāb͕a Devid na ndikom-ya buruburu inwude ha. 27 Ma onye-ozi biakutere Sọl, si, Me ngwa, lata; n'ihi na ndi Filistia amadewo imegide ala-ayi. 28 Sọl we si n'ichu Devid n'azu laghachi, je izute ndi Filistia: n'ihi ya ka ha kpọrọ ebe ahu Sela-hamahlekot. 29 Devid we si n'ebe ahu rigo, nọdu n'ebe ewusiri ike nke En-gedi.

1 Samuel 24

1 O rue, mb͕e Sọl siri n'iso ndi Filistia lata, na egosiri ya, si, Le, Devid nọ n'ọzara En-gedi. 2 Sọl we chiri nnù ndikom asa na ọgu iri arọputara n'Israel nile, ọ je ichọ Devid na ndikom-ya n'elu oké nkume nke ewu-ọhia. 3 Ọ biarue ogige ìgwè ewu na aturu n'uzọ, ọb͕à di kwa n'ebe ahu; Sọl we ba ikpuchi ukwu-ya. Ma Devid na ndikom-ya nānọdu n'akuku ime ọb͕à ahu. 4 Ndikom Devid we si ya, Le, ubọchi nke Jehova siri gi, Le, Mu onwem nēnye onye-iro-gi n'aka-gi, i gēme kwa ya dika o si di nma n'anya-gi. Devid we bilie, were nzuzo bipu ọnu-ọnu uwe-nwuda nke Sọl nwere. 5 O rue, ka emesiri, na obi Devid tara ya uta, n'ihi na o bipuru ọnu-ọnu uwe-nwuda Sọl nwere. 6 Ọ si ndikom-ya, Ya burum ihe-árú site na Jehova; m'gaghi-eme onye-nwem, bú onye Jehova etere manu, ihe a ma-ọli, bú iseti akam megide ya, n'ihi na onye Jehova etere manu ka ọ bu. 7 Devid we were okwu ndia b͕ochie ndikom-ya, o kweghi kwa ka ha bilie imegide Sọl. Sọl we si n'ọb͕à ahu bilie, je ije-ya. 8 Devid we bilie ka emesiri, si n'ọb͕à ahu pua, kpọ òkù n'azu Sọl, si, Onye-nwem eze. Sọl we legide anya n'azu-ya, Devid we rube iru-ya n'ala, kpọ isi ala. 9 Devid we si Sọl, N'ìhi gini ka i nēge nti okwu madu, si, Le, Devid nāchọ imejọ gi? 10 Le, ubọchi ta ka anya-gi abua huworo otú Jehova nyere gi n'akam ta n'ọb͕à: ewe si ka m'b͕ue gi: ma anyam mere gi ebere; m'we si, M'gaghi-eseti akam megide onye-nwem, n'ihi na onye Jehova etere manu ka ọ bu. 11 Ma, nnam, le, e, le ọnu-ọnu uwe-nwuda-gi n'akam: n'ihi na nime nbipu m'bipuru ọnu-ọnu uwe-nwuda-gi, ma eb͕ughm i, gi mara hu kwa na ọ dighi ihe ọjọ ma-ọbu njehie di n'akam, emehieghkwam megide gi; ma gi onwe-gi nāchu ntá nkpuru-obim iwere ya. 12 Jehova kpe ikpe n'etiti mu na gi, Jehova bọ-kwa-ram ọ́bọ̀ n'aru gi: ma akam agaghi-adi n'aru gi. 13 Dika ilu ndi mb͕e mbu nāsi, Na ndi nēmebi iwu ka nmebi-iwu si aputa: ma akam agaghi-adi n'aru gi. 14 Ònye ka eze Israel putaworo iso n'azu? ònye ka i nāchu n'azu? ọ bu n'azu nkita nwuru anwu, n'azu otù igwu. 15 Ma Jehova buru onye-ikpe, kpe ikpe n'etiti mu na gi, Ya hu kwa, kpe ọnum n'ikpe, kpeputam n'aka-gi. 16 O rue, mb͕e Devid gwabìri Sọl okwu ndia, na Sọl siri, Ọ̀ bu olu-gi, bú nka, nwam Devid? Sọl we welie olu-ya, kwa ákwá. 17 Ọ si Devid, Onye ezi omume ka i bu karim: n'ihi na gi onwe-gi emewom ezi ihe, ma mu onwem emewo gi ihe ọjọ. 18 Gi onwe-gi egosiwo ta na i mewo ezi ihe n'ebe m'nọ: n'ihi na mb͕e Jehova mechibidorom nye n'aka-gi, i b͕ughm. 19 Ma mb͕e madu gāchọta onye-iro-ya, ò gēzilaga kwa ya n'ezi uzọ? Jehova kwughachi kwa gi ezi ihe n'ọnọdu ihe a i meworom ta. 20 Ma ub͕u a, le, amawom na i ghaghi ibu eze, na agēme kwa ka ala-eze Israel guzosie ike n'aka-gi. 21 Ma ub͕u a were Jehova ṅuaram iyi, na i gaghi-ebipu nkpurum gānọchim n'azu, na i gaghi-ekpochapu aham n'ulo nnam. 22 Devid we ṅuara Sọl iyi. Sọl we laghachi; ma Devid na ndikom-ya rigoro n'ebe ahu ewusiri ike.

1 Samuel 25

1 Samuel we nwua; Israel nile we chikọta onwe-ha, tiere ya aka n'obi, lìe ya n'ulo-ya na Rema. Devid we bilie, rida rue ọzara Peran. 2 Ma otù nwoke bi na Maon, nke ọlu ọ nālu di na Kamel; nwoke ahu di kwa nọ̄ uku, ọ nwe-kwa-ra nnù aturu asa na ọgu iri, na nnù ewu abua na ọgu iri: ọ we nọ n'ikpacha aji ìgwè ewu na aturu-ya na Kamel. 3 Ma aha nwoke ahu bu Nebal; aha nwunye-ya bu Abigail: nwayi ahu nwere ezi uche, ma kwa nma n'aru: ma nwoke ahu siri ike n'obi, jọ kwa njọ n'omume nile; ya onwe-ya bu kwa onye Keleb. 4 Devid we nu n'ọzara na Nebal nākpacha aji ìgwè ewu na aturu-ya. 5 Devid we ziga umu-okorọbia iri, Devid we si umu-okorọbia ahu, Rigoruenu Kamel, bakuru Nebal, jua ya ajuju bayere udo-ya n'aham, 6 si kwa ya otú a, Ndu-gi! gi onwe-gi, udo; ulo-gi, udo kwa; ihe nile i nwere, udo kwa. 7 Ma ub͕u a anuwom na i nwere ndi nākpacha aji anu: ub͕u a ayi na ndi-ọzùzù-aturu i nwere anọwo, ayi emeghi ka ihere me ha, ọ dighi kwa ihe ọ bula ha lere anya ya na o furu efu, ubọchi nile ha nọ na Kamel. 8 Jua umu-okorọbia-gi, ha gēgosi kwa gi: ka umu-okorọbia huta kwa amara n'iru gi; n'ihi na ọ bu n'ezi ubọchi ka ayi biaworo: biko, nye ndi-orù-gi, nye kwa nwa-gi Devid, ihe aka-gi gāchọta. 9 Umu-okorọbia Devid we bata, gwa Nebal okwu n'aha Devid dika okwu ndia nile si di, we nọdu du. 10 Nebal we za ndi-orù Devid, si, Ònye bu Devid? ònye bu kwa nwa Jesi? ọtutu orù di ta ndi nētiwapu onwe-ha, onye ọ bula n'aka onye-nwe-ya. 11 M'gēwere kwa achicham na mirim na anum eb͕uru eb͕u nke m'b͕uworo bayere ndim nākpacha aji anu, nye ndikom ndi m'nāmaghi ebe ha si bia? 12 Umu-okorọbia Devid we chigharia n'uzọ-ha, lata, bia gosi ya dika okwu ndia nile si di. 13 Devid we si ndikom-ya, Kenu, nwoke ọ bula mma-agha-ya n'úkwù-ya. Ha we ke, nwoke ọ bula mma-agha-ya, n'úkwù; Devid we ke kwa mma-agha-ya n'úkwù: ihe ra ka nnù ndikom we soro Devid n'azu rigo; ọgu ndikom iri we nọdu n'ebe ihe-ha di. 14 Ma otù okorọbia nime umu-okorọbia Nebal gosiri Abigail, bú nwunye Nebal, si, Le, Devid siri n'ọzara zite ndi-ozi igọzi onye-nwe-ayi; o we makwasi ha. 15 Ma ndikom ahu di nma nke-uku ka ha si me ayi, emeghi kwa ka ihere me ayi, ọ dighi kwa ihe ọ bula ayi lere anya ya na o furu efu n'ubọchi nile ayi na ha nējeghari, mb͕e ayi nọ n'ọhia: 16 ha buru ayi mb͕idi ma abali ma ehihie, ubọchi nile ayi na ha nọ mb͕e ayi nāzù ìgwè ewu na aturu. 17 Ma ub͕u a mara hu kwa ihe i gēme; n'ihi na ezubesiri ihe ọjọ ike megide onye-nwe-ayi, megide kwa ulo-ya nile: ma ya onwe-ya bu nwoke jọb͕uru onwe-ya, nke madu nāpughi igwa ya okwu. 18 Abigail we me ngwa, chiri ọgu ob͕e achicha iri, na karama-akpukpọ abua nke manya-vine juru nime ha, na aturu ise edoziri edozi, na mb͕é ọka aṅara aṅa ise, na ọgu uyọkọ nkpuru-vine amiri ami ise, na ọgu mbadamba fig iri, we bo ha inyinya-ibu. 19 Ọ we si umu-okorọbia-ya, Gabiganu n'irum; le, m'nābia n'azu unu. Ma o gosighi di-ya, bú Nebal. 20 O rue, mb͕e inyinya-ibu nēbu nwayi ahu ga, mb͕e ọ nārida kwa n'ebe-nzuzo nke ugwu ahu, le, Devid na ndikom-ya nārida izute ya; o we zute ha. 21 Ma Devid siri, Nání n'efu ka m'debeworo ihe nile nke nwoke a nwere n'ọzara, ọ dighi kwa ihe ọ bula elere anya ya na o furu efu n'ihe nile o nwere: o we nyeghachim ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe. 22 Chineke me ndi-iro Devid otú a, me kwa ha ihe ọzọ otú a, ọ buru na emem ka nwoke ọ bula fọdu rue ìhè ututu n'etiti ndi nile o nwere. 23 Abigail we hu Devid, me ngwa, si n'inyinya-ibu-ya rida, da kpue iru-ya n'ala n'iru Devid, kpọ isi ala. 24 O we da n'ala n'ukwu-ya, si, Onye-nwem, ka ajọ omume ahu dikwasi mu onwem: ma biko, ka orù-gi nwayi kwue na nti-gi, gi nuru kwa okwu nile nke orù-gi nwayi. 25 Biko, ka onye-nwem ghara itukwasi obi-ya n'aru nwoke a jọb͕uru onwe-ya, bú Nebal: n'ihi na dika aha-ya si di, otú a ka ya onwe-ya di; Nebal bu aha-ya, ihe-nzuzu di kwa n'aka-ya: ma mu onwem, bú orù-gi nwayi, ahughm umu-okorọbia onye-nwem, ndi i zitere. 26 Ma ub͕u a, onye-nwem, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, ebe Jehova b͕ochiworo gi ka i ghara ibà n'ikpe-ọmuma ọbara, ka aka-gi ghara kwa izọputa gi, ub͕u a kwa ka ndi-iro-gi na ndi nāchọ ime onye-nwem ihe ọjọ di ka Nebal. 27 Ma ub͕u a ngọzi a nke nwayi nējere gi ozi wetaworo onye-nwem, ka enye ya umu-okorọbia ndi nēso onye-nwem n'ukwu n'ukwu jeghari. 28 Biko, b͕aghara njehie orù-gi nwayi: n'ihi na Jehova aghaghi imere onye-nwem ulo kwesiri ntukwasi-obi, n'ihi na ọ bu agha nile nke Jehova ka onye-nwem nēbu; agaghi-ahuta kwa ihe ọjọ n'aru gi ubọchi-gi nile. 29 Ọ bu kwa ezie na madu biliri ichu gi, na ichọ nkpuru-obi-gi: ma agēke nkpuru-obi onye-nwem na ngugu nke ndi di ndu n'aka Jehova, bú Chineke-gi; ma nkpuru-obi ndi-iro-gi, ha ka Ọ gēsi n'etiti oghere èbè-Ya mapu. 30 O gēru kwa, mb͕e Jehova gēmewori nye onye-nwem dika ezi ihe nile si di nke O kwuworo bayere gi, mb͕e Ọ gēnyewo kwa gi-ri iwu ibu onye-ndú Israel; 31 na nka agaghi-aburu gi ihe-nṅaghari, ọ gaghi-aburu kwa onye-nwem ihe-isu-ngọngọ obi, na i wusiwo ọbara n'efu, ma-ọbu na onye-nwem azọputawo onwe-ya: ma mb͕e Jehova gēmewori onye-nwem nma, i gēcheta kwa orù-gi nwayi. 32 Devid we si Abigail, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke Israel, bu, Onye zitere gi ta izutem: 33 ihe agọziri agọzi ka ezi uche-gi bu kwa, onye agọziri agọzi ka i bu kwa, onye b͕ochiworom ta ka m'ghara ibà n'ikpe-ọmuma ọbara, ka akam ghara kwa izọputam. 34 Ma otú ọ di, Jehova, bú Chineke Israel nādi ndu, Onye b͕ochiworom ka m'ghara imejọ gi, n'ezie ọ buru na i meghi ngwa bia izutem, agaghi-eme ka nwoke fọduru Nebal ma-ọli rue ìhè ututu. 35 Devid we nara n'aka-ya ihe o wetara ya: ọ si ya, Rigorue ulo-gi n'udo; le, egewom nti olu-gi, hu kwa gi iru-ọma. 36 Abigail we biakute Nebal; ma, le, o nwere oké oriri n'ulo-ya, dika oké oriri eze; obi Nebal we di nma nime ya, ọ ṅubiga-kwa-ra manya okè nke-uku: Abigail we ghara igosi ya okwu ọ bula, okwu ntà ma-ọbu okwu uku, rue ìhè ututu. 37 O rue, n'ututu, mb͕e manya-vine puworo n'anya Nebal, na nwunye-ya gosiri ya okwu ndia, obi-ya we nwua n'etiti ya, ya onwe-ya we di ka nkume. 38 O rue, mb͕e ihe ra ka ubọchi iri gabigara, na Jehova tib͕uru Nebal, o we nwua. 39 Devid we nu na Nebal anwuruwo, ọ si, Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, Onye kpere ọnu ihe-ita-utam n'ikpé, me ka m'pua n'aka Nebal, O we b͕ochie orù-Ya ka ọ ghara ime ihe ọjọ: ma ihe ọjọ Nebal ka Jehova meworo ka ọ lata n'isi-ya. Devid we ziga kwue okwu bayere Abigail, iluta ya n'onwe-ya na nwunye. 40 Ndi-orù Devid we biakute Abigail rue Kamel, gwa ya okwu, si, Devid ezitewo ayi biakute gi ilutara ya gi onwe-gi na nwunye. 41 O we bilie, kpọ isi ala, kpue iru-ya n'ala, si, Le, orù-gi nwayi bu nwayi nēje ozi isa ukwu ndi-orù onye-nwem. 42 Abigail we me ngwa, bilie, nọkwasi n'inyinya-ibu, ya na umu-ab͕ọghọ-ya ise ndi nējeso ya n'ukwu n'ukwu; o we nējeso ndi-ozi Devid n'azu, ghọrọ ya nwunye. 43 Devid kuru-kwa-ra Ahinoam nke Jezreel; ha we ghọrọ ya nwunye, ọbuná ha abua. 44 Ma Sọl were Maikal nwa-ya, bú nwunye Devid, nye Palti nwa-nwoke Laish, onye sitere na Galim.

1 Samuel 26

1 Ndi Zif we biakute Sọl rue Gibea, si, Devid, ọ̀ dighi-ezo onwe-ya n'ugwu ntà Hakila, nke di n'iru ala ahu nke tọb͕ọrọ n'efu? 2 Sọl we bilie, rida rue ọzara Zif, ya na nnù ndikom asa na ọgu iri, ndi arọputara nke Israel, ichọ Devid n'ọzara Zif. 3 Sọl we ma ulo-ikwū-ya n'ugwu ntà Hakila, nke di n'iru ala ahu nke tọb͕ọrọ n'efu, n'akuku uzọ. Ma Devid nānọdu n'ọzara, ọ hu na Sọl abiawo, nēso ya n'azu rue ọzara. 4 Devid we ziga ndi-nledo, mara na Sọl abiawo n'ebe o dozisiri onwe-ya. 5 Devid we bilie, biarue ebe Sọl mara ulo-ikwū-ya: Devid we hu ebe ahu, bú ebe Sọl nēdina, ya na Abnea nwa Nea, bú onye-isi usu-ndi-agha-ya: ma Sọl nēdina n'ebe anēdebe ub͕ọ-ala, ndi Israel nānọ kwa n'ulo-ikwū buruburu ya. 6 Devid we za, si Ahimelek, bú onye Het, si kwa Abishai nwa Zeruaia, bú nwa-nne Joab, si, Ònye gēsorom ridakuru Sọl, rue ọmuma-ulo-ikwū? Abishai we si, Mu onwem gēsoro gi rida. 7 Devid na Abishai we biakute ndi Israel n'abali: ma, le, Sọl nēdina n'ura n'ebe anēdebe ub͕ọ-ala, atugide-kwa-ra ube-ya n'ala n'akuku isi-ya: Abnea na ndi Israel nēdina kwa ya buruburu. 8 Abishai we si Devid, Chineke emechibidowo onye-iro-gi nye n'aka-gi ta: ma ub͕u a, biko, ka m'were ube tugide ya n'ala otù ub͕ò, m'gaghi-atu kwa ya nke ub͕ò abua. 9 Devid we si Abishai, Ebibila ya: n'ihi na ònye ka ikpe nāmaghi n'iseti aka-ya megide onye Jehova etere manu? 10 Devid we si, Jehova nādi ndu, Jehova aghaghi itib͕u ya; ma-ọbu ubọchi-ya gābiaru, o we nwua; ma-ọbu na ọ gārida n'agha, ewe kpochapu ya. 11 Ya burum ihe-árú sitere na Jehova, bú iseti akam megide onye Jehova etere manu: ma ub͕u a, biko, were ube di n'akuku isi-ya, na ite miri, ka ayi la. 12 Devid we were ube na ite miri site n'akuku isi Sọl; ha we la, ma ọ dighi onye nāhu ha, ọ dighi kwa onye mara, ọ dighi kwa onye nēteta: n'ihi na ha nile nāraru ura; n'ihi na oké ura nke Jehova dakwasiri ha. 13 Devid we gabiga n'ofè ọzọ, guzo n'elu ugwu n'ebe di anya; ebe-mbara n'etiti ha riri nne: 14 Devid we kpọ ndi Israel òkù, kpọ kwa Abnea nwa Nea, si, Ì zaghi, Abnea? Abnea we za, si, Ònye ka i bu nke nākpọ eze òkù? 15 Devid we si Abnea, Ọ̀ bughi nwoke ka i bu? ònye di kwa ka gi n'Israel? n'ìhi gini kwa ka i nēdebeghi onye-nwe-gi, bú eze, nke-ọma? n'ihi na otù onye nime ndi Israel batara ibibi eze, bú onye-nwe-gi. 16 Ọ dighi nma, bú ihe a nke i meworo. Jehova nādi ndu, ndi kwesiri ọnwu ka unu bu, n'ihi na unu edebeghi onye-nwe-unu nke-ọma, bú onye Jehova etere manu. Ma ub͕u a, le ebe ube eze di, na ite miri nke di n'akuku isi-ya. 17 Sọl we mata olu Devid, si, Ọ̀ bu olu-gi bú nka, nwam Devid? Devid we si, Ọ bu olum, onye-nwem, eze. 18 Ọ si kwa, N'ìhi gini kwa ka onye-nwem nāchu orù-ya n'azu? n'ihi na gini ka m'mere? ìhe ọjọ gini di kwa n'akam? 19 Ma ub͕u a, biko, ka onye-nwem, bú eze, nuru okwu nile nke orù-ya. Ọ buru na Jehova arafuwo gi imegidem, Ya nu ísì utọ nke onyinye-inata-iru-ọma: ma ọ buru umu madu, ndi anābu ọnu ka ha bu n'iru Jehova; n'ihi na ha achupuwom ta n'irapara n'aru ihe-nketa Jehova, si, Je, fè chi ọzọ òfùfè. 20 Ma ub͕u a, ka ọbaram ghara ida n'ala pua n'iru Jehova: n'ihi na eze Israel aputawo ichọ otù igwu, dika mb͕e madu nāchu ntá ọkwa n'ugwu. 21 Sọl we si, Emehiewom: lata, nwam Devid: n'ihi na m'gaghi-emejọ gi ọzọ, n'ihi na ndum di oké ọnu-ahia n'anya-gi ta: le, emewom ihe-nzuzu, me kwa ihe nke-uku ri nne n'amaghi-ama. 22 Devid we za, si, Le, ube-gi, eze! ka otù onye nime umu-okorọbia feta kwa, were ya. 23 Jehova gēnyeghachi kwa nwoke ọ bula ezi omume-ya na ikwesi-ntukwasi-obi-ya: ebe Jehova nyeworo gi n'akam ta, ma ekweghm iseti akam imegide onye Jehova etere manu. 24 Ma, le, dika ndu-gi di uku ta n'anyam, ka ndum di uku otú a n'anya Jehova, ka Ọ naputakwam na nkpab͕u nile. 25 Sọl we si Devid, Onye agọziri agọzi ka i bu, nwam Devid: i gēme kwa ihe nke-uku, nwe kwa ike nke-uku. Devid we je n'uzọ-ya, ma Sọl laghachiri n'ebe-ya.

1 Samuel 27

1 Devid we si obi-ya. Ub͕u a agēkpochapum otù ubọchi site n'aka Sọl: ọ dighi ihe dirim nma kari iwepugasi onwem ba n'ala ndi Filistia; Sọl agaghi-atukwasi kwa obi-ya n'arum, ichọm ọzọ n'ókè-ala nile nke Israel: m'gēwepuga kwa onwem n'aka-ya. 2 Devid we bilie, gabiga, ya onwe-ya na nnù ndikom na ọgu iri ndi nọ n'aka-ya, biakute Ekish nwa Maok, bú eze Gat. 3 Devid we biri n'aka Ekish na Gat, ya onwe-ya na ndikom-ya, nwoke ọ bula na ulo-ya, bú Devid na ndinyom-ya abua, Ahinoam nwayi Jezreel, na Abigail nwayi Kamel, bú nwunye Nebal. 4 Ewe gosi Sọl na Devid ab͕alagawo rue Gat: o we ghara ichọ ya ọzọ ma-ọli. 5 Devid we si Ekish, Biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru-gi, ka ha nyem ebe n'otù obodo nime obodo ọhia, ka m'we biri n'ebe ahu: ma n'ìhi gini ka orù-gi gēbi n'obodo eze n'aka-gi? 6 Ekish we nye ya Ziklag n'ubọchi ahu: n'ihi ya ndi-eze Juda nwe Ziklag rue ta. 7 Ọnu-ọgugu ubọchi Devid biri n'ọhia ndi Filistia bu otù arọ zuru ezu na ọnwa anọ. 8 Devid na ndikom-ya we rigo, made imegide ndi Geshua, na ndi-Giazait, na ndi Amalek: n'ihi na ndi ahu bu ndi bi n'ala ahu, ndi sitere na mb͕e ebighi-ebi gara aga, ebe i nābà na Shua, we rue n'ala Ijipt. 9 Devid we tib͕ue ala ahu, o meghi kwa ka nwoke ma-ọbu nwayi di ndu, ma ọ chiri ìgwè ewu na aturu, na ìgwè ehi, na inyinya-ibu, na camel, na uwe, laghachi, biakute Ekish. 10 Ekish we si, Ònye ka unu madere megide ta? Devid we si, Megide Negeb nke Juda, megide kwa Negeb nke ndi Jerahmeel, megide kwa Negeb nke ndi-Kinait. 11 Ma Devid emeghi ka nwoke ma-ọbu nwayi di ndu, ime ka ha ba na Gat, ọ si, Ka ha we ghara igosi ihe bayere ayi, si, Otú a ka Devid mere, otú a ka ọ ganēme kwa ubọchi nile o nēbi n'ọhia ndi Filistia. 12 Ekish we kwere Devid, si, Ọ mewo onwe-ya ka o sì ísì ọjọ nke-uku n'etiti ndi-ya, bú Israel; ọ gābu-kwa-ram orù mb͕e ebighi-ebi.

1 Samuel 28

1 O rue, na mb͕e ahu, na ndi Filistia chikọtara ọmuma-ulo-ikwū-ha ibu agha, ibuso Israel agha. Ekish we si Devid, Mara nke-ọma na mu ka i gēso pua ba n'ọmuma-ulo-ikwū, gi onwe-gi na ndikom-i. 2 Devid we si Ekish, N'ihi ya gi onwe-gi gāmara ihe orù-gi gēme. Ekish we si Devid, N'ihi ya onye nēdebe isim ka m'gēdo gi ubọchi nile. 3 Ma Samuel anwuruwo, Israel nile we tiere ya aka n'obi, lì kwa ya na Rema, bú n'obodo-ya. Sọl ewezugawo kwa n'ala ndi nāju mọ ihe na ndi-dibia-afa. 4 Ndi Filistia we chikọta onwe-ha, bia, ma ulo-ikwū-ha na Shunem: Sọl we chikọta Israel nile, ha we ma ulo-ikwū-ha na Gilboa. 5 Sọl we hu ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia, o we tua egwu, obi-ya we ma jijiji nke-uku. 6 Sọl we jua Jehova ase, ma Jehova azaghi ya, Ọ zaghi na nrọ, ma-ọbu n'Ìhè, ma-ọbu n'ọnu ndi-amuma. 7 Sọl we si ndi-orù-ya, Chọrọnum nwayi nwere mọ ọ nāju ihe, ka m'we jekuru ya, jua ya ase. Ndi-orù-ya we si ya, Le, otù nwayi di n'En-doa nke nwere mọ ọ nāju ihe. 8 Sọl we nwogharia onwe-ya, yiri uwe ọzọ, je, ya onwe-ya na ndikom abua tiyere ya, ha we biakute nwayi ahu n'abali: ọ si, Biko, were mọ i nāju ihe juaram ase, me ka ọ rigokutem, bú onye ọ bula m'gāsi gi. 9 Nwayi ahu we si ya, Le, gi onwe-gi amawo ihe Sọl mere, na o bipuwo n'ala ndi nāju mọ ihe na ndi-dibia-afa: n'ìhi gini kwa ka gi onwe-gi nāb͕ara ndum ọnyà ime ka m'nwua? 10 Sọl we were Jehova ṅuara ya iyi, si, Jehova nādi ndu, Ahuhu ajọ omume agaghi-ezute gi ma-ọli n'ihe a. 11 Nwayi ahu we si, Ònye ka m'gēme ka ọ rigokute gi? Ọ si, Me ka Samuel rigokutem. 12 Nwayi ahu we hu Samuel, tie nkpu n'oké olu: nwayi ahu we gwa Sọl okwu, si, N'ìhi gini ka i ghọb͕uworom? n'ihi na gi onwe-gi bu Sọl. 13 Eze we si ya, Atula egwu: n'ihi na ọ̀ bu gini ka i huworo? Nwayi ahu we si Sọl, Ahuwom chi ka ha nēsi n'ala rigota. 14 Ọ si ya, Gini bu udi-aru-ya? Nwayi ahu we si, Agadi nwoke nārigota; eji kwa uwe-nwuda kpuchi nwoke ahu. Sọl we mata na Samuel ka ọ bu, ọ we rube isi-ya, da kpue iru-ya n'ala, kpọ isi ala. 15 Samuel we si Sọl, N'ìhi gini ka i nēkweghi ka m'nọdu ndu, ime ka m'rigota? Sọl we si, Anọm na nkpà nke-uku; ndi Filistia nēbusokwam agha, ma Chineke ewezugawo Onwe-ya n'arum, Ọ dighi-azakwam ọzọ, ma ọ bu n'aka ndi-amuma ma-ọbu na nrọ: m'we kpọ gi, ka i we me ka m'mara ihe m'gēme. 16 Samuel we si, N'ìhi gini kwa ka i nājum ajuju, ebe Jehova wezugaworo Onwe-ya n'aru gi, we ghọ onye-iro-gi? 17 Ma Jehova emeworo Onwe-ya, dika O kwuru site n'akam: Jehova adọwapuwo kwa ala-eze n'aka-gi, nye ya madu-ibe-gi, bú Devid. 18 N'ihi na i geghi nti olu Jehova, i meghi kwa ka idi-ọku nke iwe-Ya dakwasi Amalek, n'ihi ya ka Jehova meworo gi ihe a ta. 19 Ọzọ kwa, Jehova gēnye Israel n'aka ndi Filistia tiyere gi: echi ka gi na umu-gi ndikom gānọye-kwa-ram: Jehova gēnye kwa ọmuma-ulo-ikwū Israel n'aka ndi Filistia. 20 Sọl we da n'ala ngwa ngwa ka idi-elu-ya ra, o we tua egwu nke-uku, n'ihi okwu nile nke Samuel: ike adighi kwa nime ya; n'ihi na o righi nri n'ehihie ahu nile, na n'abali ahu nile. 21 Nwayi ahu we biakute Sọl, hu na aru mara ya jijiji nke-uku, ọ si ya, Le, nwanyi nējere gi ozi egewo nti olu-gi, m'we tiye ndum n'ọbu-akam, nu kwa okwu-gi nile nke i gwaram. 22 Ma ub͕u a, biko, gi onwe-gi ge kwa nti olu nwayi nējere gi ozi, ka m'dọba kwa iberibe achicha n'iru gi; gi ri kwa, ka ike we di nime gi, mb͕e i nēje n'uzọ-gi. 23 Ma ọ juru aju, si, M'gaghi-eri ihe. Ndi-orù-ya, na nwayi ahu kwa, we rugide ya; o we ge nti olu-ha. O we si n'ala bilie, nọkwasi n'ihe-ndina. 24 Ma nwayi ahu nwere n'ulo-ya nwa-ehi emere ka ọ ma abuba; o we me ngwa, b͕ue ya, were kwa utu ọka, gwọ ya, were ya sie achicha ekoghi-eko: 25 o we bute ya nso n'iru Sọl, na n'iru ndi-orù-ya; ha we rie. Ha we bilie, la n'abali ahu.

1 Samuel 29

1 Ma ndi Filistia chikọtara ọmuma-ulo-ikwū-ha nile rue Efek: Israel nāma kwa ulo-ikwū-ha n'akuku isi-iyi nke di na Jezreel. 2 Ndi-isi ndi Filistia we nāgabiga ọgu ise, ọgu ise, na nnù abua na ọgu iri, nnù abua na ọgu iri: Devid na ndikom-ya nāgabiga kwa n'azu, ha na Ekish. 3 Ndi-isi Filistia we si, Ndi-Hibru ndia, hà bu gini? Ekish we si ndi-isi ndi Filistia, Nkà abughi Devid, bú orù Sọl eze Israel, onye mu na ya nọworo ubọchi ndia ma-ọbu arọ ndia, ma ahutaghm n'aru ya ihe ọ bula di njọ site n'ubọchi ọ dapuru n'aka Sọl rue ta? 4 Ma ndi-isi ndi Filistia were iwe megide ya; ndi-isi ndi Filistia we si ya, Me ka nwoke a laghachi, ka o we laghachi n'ọnọdu-ya ebe i mere ka ọ buru onye-nlekọta-ya, ma ka ọ ghara iso ayi rida n'agha, ka o we ghara ighọrọ ayi onye-nmegide n'agha ahu: n'ihi na onye a gēji gini me ka ihe-ya tọ onye-nwe-ya utọ? ọ̀ gaghi-eji isi ndikom ndia? 5 Nkà abughi Devid, onye ha zaritara onwe-ha ihe bayere ya n'ite-egwú si, Sọl etib͕uwo ndi-iro-ya, nnù ndikom abua na ọgu iri, nnù ndikom abua na ọgu iri, Devid kwa ndi-iro-ya, orú nnù ndikom na nnù ise, orú nnù ndikom na nnù ise? 6 Ekish we kpọ Devid, si ya, Jehova nādi ndu, n'ezie onye ziri ezi ka i bu: ọpupu-gi na nbata-gi n'ọmuma-ulo-ikwū n'akam di kwa nma n'anyam: n'ihi na ahutaghm ihe ọjọ n'aru gi site n'ubọchi i biakuterem rue ta: ma n'anya ndi-isi onye nādighi nma ka i bu. 7 Ma ub͕u a, laghachi, je kwa n'udo, ka i we ghara ime ihe ọjọ n'anya ndi-isi ndi Filistia. 8 Devid we si Ekish, Ma gini ka m'meworo? gini kwa ka i hutaworo n'aru orù-gi site n'ubọchi m'nọworo n'iru gi rue ta, na m'gaghi-abà buso ndi-iro onye-nwem, bú eze, agha? 9 Ekish we za, si Devid, Amawom na onye di nma n'anyam ka i bu, dika mọ-ozi Chineke: ọ bu nání na ndi-isi Filistia asiwo, Ọ gaghi-eso ayi rigo n'agha. 10 Ma ub͕u a bilie n'isi-ututu, gi na ndi-orù onye-nwe-gi ndi soro gi bia: mb͕e unu biliri n'isi-ututu, mb͕e ìhè diri unu, laghachi-kwa-nu. 11 Devid we bilie n'isi-ututu, ya onwe-ya na ndikom-ya, ila n'ututu, ilaghachi n'ala ndi Filistia. Ndi Filistia we rigo rue Jezreel.

1 Samuel 30

1 O rue, mb͕e Devid na ndikom-ya biaruru Ziklag n'ubọchi nke-atọ, na ndi Amalek amadewo na Negeb, made kwa na Ziklag, ha etib͕uwo kwa Ziklag, sure ya n'ọku, 2 dọta kwa ndinyom na ndi nile nọ na ya n'agha, site n'onye ntà we rue onye uku: ha emeghi ka onye ọ bula nwua, kama ha dupuru ha, je ije-ha. 3 Devid na ndikom-ya we ba n'obodo, ma, le, esurewo ya n'ọku; adọtawo kwa ndinyom-ha na umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom n'agha. 4 Devid na ndi ya na ha nọ we welie olu-ha kwa ákwá, rue mb͕e ike nādighi ha n'aru ọzọ ikwa ákwá. 5 Adọta-kwa-ra ndinyom abua nke Devid n'agha, bú Ahinoam nwayi Jezreel, na Abigail nwunye Nebal onye Kamel. 6 Devid we nọ na nkpà nke-uku; n'ihi na ndi-ya siri ka ha were nkume tub͕ue ya, n'ihi na nkpuru-obi ndi-ya nile di ilu, nwoke ọ bula n'ihi umu-ya ndikom na n'ihi umu-ya ndinyom: ma Devid mere onwe-ya ka ọ di ike nime Jehova, bú Chineke-ya. 7 Devid we si Abaiata, bú onye-nchu-àjà, bú nwa Ahimelek, Biko, chitaram ephod nso. Abaiata we chita ephod ahu nso n'ebe Devid nọ. 8 Devid we jua Jehova ase, si, Ọ buru na achuam usu a ndi nāpunara madu ihe n'azu, #m'gēru ha aru? Ọ si ya, Chua: n'ihi na i ghaghi iru ha aru, i ghaghi kwa inaputa ha ihe nile. 9 Devid we je, ya onwe-ya na nnù ndikom na ọgu iri ndi soro ya, ọ biarue miri-iyi Besoa, ma ndi anārapu n'azu guzoro n'ebe ahu. 10 Ma Devid nāchu, ya onwe-ya na nnù ndikom: ma ọgu ndikom iri guzoro n'azu, ndi ike gwuru nke-uku na ha apughi igabiga miri-iyi Besoa: 11 ha we huta onye Ijipt n'ọhia, kuru ya jekuru Devid, nye ya achicha, o rie; ha we me ka ọ ṅua miri: 12 ha we nye ya iberibe mbadamba fig, na uyọkọ abua nke nkpuru-vine amiri ami; o we rie, mọ-ya we laghachikute ya: n'ihi na o righi nri, ọ ṅughi kwa miri, ubọchi atọ ehihie na abali. 13 Devid we si ya, Ònye nwe gi? òle ebe i si bia kwa? Ọ si, Nwa-okorọbia Ijipt ka m'bu, m'buru kwa otù nwoke, bú onye Amalek, orù; onye-nwem we rapum, n'ihi na aru adighm ike ubọchi atọ gara aga. 14 Ayi onwe-ayi madere na Negeb nke ndi Keret, made kwa n'ala nke Juda nwere, made kwa na Negeb nke Keleb; ayi we sure Ziklag n'ọku. 15 Devid we si ya, Ì gēme ka m'ridakuru usu ahu ndi nāpunara madu ihe? Ọ si, Were Chineke ṅuaram iyi, na i gaghi-eme ka m'nwua, na i gaghi-emechibidokwam nye n'aka onye-nwem, m'gēme kwa ka i ridakuru usu ahu ndi nāpunara madu ihe. 16 O we me ka ọ rida, ma, le, ha ab͕asawo n'iru ala ahu nile, nēri ihe, nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, nēme kwa ememe, n'ihi ihe-nkwata uku nile nke ha kwatara n'ala ndi Filistia, na n'ala Juda. 17 Devid we tib͕ue ha site n'ururuchi we rue anyasi echi-ya: ọ dighi kwa otù nwoke nime ha wepugara onwe-ya, ma-ọbughi nnù umu-okorọbia, ndi nọkwasiri na camel-ha, we b͕alaga. 18 Devid we naputa ihe nile Amalek chiri: Devid naputa-kwa-ra ndinyom-ya abua. 19 Ọ dighi kwa ihe fọduru ha iweghachi, ma ihe ntà ma ihe uku, ma umu-ndikom ma umu-ndinyom, ma ihe-nkwata ma ihe ọ bula ha were n'onwe-ha: Devid weghachiri ihe nile. 20 Devid we chiri ìgwè ewu na aturu nile na ìgwè ehi; ha dupuru ha n'iru anu-ulo ndia, si, Nka bu ihe-nkwata Devid. 21 Devid we biakute ọgu ndikom iri ahu, ndi ike gwuru nke-uku na ha apughi ijeso Devid n'azu, ndi ha me-kwa-ra ka ha nọdu n'akuku miri-iyi Besoa: ha we puta izute Devid, na izute ndi ya na ha nọ: Devid we biarue nso ndi ahu, jua ha ajuju bayere udo-ha. 22 Ndikom ọjọ nile na ndi jọb͕uru onwe-ha, n'etiti ndi soro Devid je, we za, si, N'ihi na ha esoghi ayi je, ayi agaghi-enye kwa ha ihe ọ bula nime ihe-nkwata nke ayi naputara, ma-ọbughi inye nwoke ọ bula nwunye-ya na umu-ya, ka ha we duru ha, la. 23 Devid we si, Umu-nnem, ihe Jehova nyere ayi, bú Onye debere ayi, nye kwa n'aka-ayi usu ahu ndi nāpunara madu ihe, ndi biara imegide ayi, unu agaghi-ewere ihe ahu me otú a. 24 Ònye gēge kwa unu nti n'okwu a? n'ihi na dika òkè nke onye nārida n'agha si di, otú a ka òkè nke onye nānọdu n'akuku ihe-ayi di: ha gēkekọ n'otù. 25 O rue, site n'ubọchi ahu we ga n'iru, na o doro ya ibu ukpuru na ibu ikpé nye Israel, rue ta. 26 Devid we biarue Ziklag, zigara ndi-okenye Juda, bú ndi-eyì-ya, ufọdu nime ihe-nkwata, si, Le, ihe-ngọzi unu gēnwe sitere n'ihe-nkwata nke ndi-iro Jehova; 27 o zigara ndi nọ na Bet-el, ziga-kwa-ra ndi nọ na Remot nke Negeb, ziga-kwa-ra ndi nọ na Jatia; 28 ziga-kwa-ra ndi nọ n'Aroea, ziga-kwa-ra ndi nọ na Sifmot, ziga-kwa-ra ndi nọ n'Eshtemoa; 29 ziga-kwa-ra ndi nọ na Rakal, ziga-kwa-ra ndi nọ n'obodo nile nke ndi Jerahmeel, ziga-kwa-ra ndi nọ n'obodo nile nke ndi-Kinait; 30 ziga-kwa-ra ndi nọ na Họma, ziga-kwa-ra ndi nọ na Koa-ashan, ziga-kwa-ra ndi nọ n'Atak; 31 ziga-kwa-ra ndi nọ na Hebron, ziga kwa n'ebe nile ebe Devid onwe-ya na ndikom-ya nējeghari.

1 Samuel 31

1 Ma ndi Filistia nēbuso Israel agha: ndikom Israel we b͕alaga n'iru ndi Filistia, ha we da, buru ndi eb͕uru eb͕u n'ugwu Gilboa. 2 Ndi Filistia we sosie Sọl na umu-ya ndikom ike; ndi Filistia we tib͕ue Jonatan, na Abinadab, na Malki-shua, bú umu-ndikom Sọl. 3 Agha ahu we di arọ́ megide Sọl, ndi-ọb͕a-uta we huta ya, bú ndikom chiri uta; ọ we nēb͕u ya nb͕u nke-uku site n'ib͕a-uta nke ndi-ọb͕a-uta. 4 Sọl we si onye nēbu ihe-agha-ya, Miputa mma-agha-gi, were ya mapuem aru; ka ndia anēbìghi úgwù ghara ibia mapuem aru, we kwam emò. Ma onye nēbu ihe-agha-ya ekweghi; n'ihi na ọ nātu egwu nke-uku. Sọl we were mma-agha-ya, dakwasi ya. 5 Onye nēbu ihe-agha-ya we hu na Sọl anwuwo, ya onwe-ya we dakwasi kwa na mma-agha-ya, soro ya nwua. 6 Sọl we nwua, ya na umu-ya ndikom atọ na onye nēbu ihe-agha-ya na ndikom-ya nile n'otù, n'ubọchi ahu. 7 Ndikom Israel ndi nọ n'ofè ọzọ ndagwurugwu ahu, na ndi nọ n'ofè Jọdan, we hu na ndikom Israel ab͕alagawo, hu kwa na Sọl na umu-ya ndikom anwuwo, ha we rapu obodo nile ha, b͕alaga; ndi Filistia we bia biri nime ha. 8 O rue, n'echi-ya, mb͕e ndi Filistia biara iyipu ihe ndi eb͕uru eb͕u, na ha huru Sọl na umu-ya ndikom atọ ka ha tọb͕ọrọ n'ugwu Gilboa. 9 Ha we bipu isi-ya, yipu ihe-agha-ya, ziga n'ala ndi Filistia buruburu, izisa ozi ahu n'ulo arusi nile ha, na n'etiti ndi-ha. 10 Ha we dọba ihe-agha-ya n'ulo Ashtarot: ma ha kpọgidere ozu-ya na mb͕idi Bet-shan. 11 Ndi bi na Jebesh-gilead we nu ihe bayere ya, bú ihe ndi Filistia mere Sọl, 12 ndikom nile bú dìnkpà we bilie, je ije ogologo abali ahu nile, si na mb͕idi Bet-shan buru ozu Sọl na ozu umu-ya ndikom; ha we biarue Jebesh, sure ha ọku n'ebe ahu. 13 Ha we chiri ọkpukpu-ha, lìe ha n'okpuru osisi tamarisk nime Jebesh, bue ọnu ubọchi asa.

2 Samuel 1

1 O rue, mb͕e ọnwu Sọl gasiri, mb͕e Devid siri na ntib͕u Amalek lata, mb͕e Devid nọwo-kwa-ra na Ziklag ubọchi abua; 2 o rue, nubọchi nke-atọ, na, le, otù nwoke siri n'ọmuma-ulo-ikwū puta, site n'ebe Sọl nọ, uwe-ya nile dọwara adọwa, ájá dikwasi n'isi-ya: o rue, mb͕e ọ biakutere Devid, na ọ daruru ala, we kpọ isi ala. 3 Devid we si ya, Òle ebe i si bia? Ọ si ya, N'ọmuma-ulo-ikwū Israel ka m'wepugara onwem. 4 Devid we si ya, Gini bu ihe emere? biko, gosim. Ọ si, Na ndi Israel esiwo n'agha b͕alaga, ọzọ kwa, ọtutu nime ndi Israel adawo nwua; ọzọ kwa, Sọl na Jonatan nwa-ya nwuru anwu. 5 Devid we si nwa-okorọbia ahu nke nēgosi ya, Ì si aṅa mara na Sọl na Jonatan nwa-ya nwuru anwu? 6 Nwa-okorọbia ahu nke nēgosi ya we si, Ọ dabataram inọ n'ugwu Gilboa, ma, le, Sọl nādabere n'ube-ya; ma, le, ub͕o-ala na ndi-nwe inyinya sosiri ya ike. 7 o we gha anya n'azu, hum, we kpọm òkù. M'we si, Lem. 8 Ọ sim, Ònye ka i bu? M'we si ya, Onye Amalek ka m'bu. 9 Ọ sim, Biko, guzo n'akukum, me ka m'nwua, n'ihi na anya-ajù ejidewom: n'ihi na ndum nile dizu nimem. 10 M'we guzo n'akuku ya, me ka ọ nwua, n'ihi na amaram na ọ gaghi-adi ndu mb͕e ọ dasiri: m'were okpu-eze nke di n'isi-ya, na ọla-aka nke di n'ogwe-aka-ya, we chitara ha onye-nwem n'ebe a. 11 Devid we jide uwe-ya, dọwa ha; otú a ka ndikom nile ya na ha nọ me-kwa-ra. 12 Ha we tie aka n'obi, kwa ákwá, bue ọnu rue anyasi, n'ihi Sọl, na n'ihi Jonatan nwa-ya, na n'ihi ndi Jehova, na n'ihi ulo Israel; n'ihi na ha dara site na mma-agha. 13 Devid we si nwa-okorọbia nēgosi ya, Òle ebe i si bia? Ọ si Nwa ọbìa, bú onye Amalek, ka m'bu. 14 Devid we si ya, Ì si aṅa ghara itu egwu iseti aka-gi ibibi onye Jehova etere manu? 15 Devid we kpọ otù nime umu-okorọbia, si, Jerue nso, dakwasi ya. O we tib͕ue ya, o we nwua. 16 Devid we si ya, Ọbara-gi dikwasi n'isi-gi; n'ihi na ọnu-gi azawo megide gi, si, Mu onwem emewo ka ọ nwua, bú onye Jehova etere manu. 17 Devid we were abù-ákwá nka bùara Sọl, bù-kwa-ra Jonatan nwa-ya: 18 Ọ we si ha zi umu Juda abù uta: le, edewo ya n'akwukwọ Jasha. 19 Israel, eb͕uwo nmá-gi n'elu ebe di elu gi! Ndi-dike esiwo aṅa da! 20 Unu egosila ya nime Gat, Unu ezisala ozi-ya n'èzí nile nke Ashkelon; Ka umu-ndinyom ndi Filistia we ghara iṅuri ọṅu, Ka umu-ndinyom nke ndi anēbìghi úgwù we ghara iṅuri ọṅu-agha. 21 Unu ugwu Gilboa, Ka igirigi ma-ọbu miri-ozuzu ghara idikwasi unu, ma-ọbu ubi nke àjà-nbuli: N'ihi na ebe ahu ka asọrọ ọta ndi-dike oyi, Ọta Sọl dika agāsi na ọ bu onye anēteghi manu. 22 Ọbara ndi eb͕uru eb͕u, abuba ndi-dike, Uta Jonatan esighi na ha la azu, Mma-agha Sọl esighi kwa lata n'efu. 23 Sọl na Jonatan bu ndi nāhurita onwe-ha n'anya, buru kwa ndi di utọ na ndu-ha, Ekewaghi kwa ha n'ọnwu-ha; Ha di garagara kari ugo, Ha di ike kari ọdum. 24 Umu-ndinyom Israel, kwaranu Sọl ákwá, Onye nēyibe unu uwe uhie, ya na ihe-utọ di iche iche, Onye nātukwasi ihe-ichọ-nma ọla-edo n'uwe-unu. 25 Ndi-dike esiwo aṅa da n'etiti agha ahu! Jonatan, n'elu ebe-gi di elu ka i buru onye eb͕uru eb͕u. 26 Anọm na nkpà n'ihi gi, nwa-nnem Jonatan: I di utọ nke-uku n'ebe m'nọ: Ihu-n'anya-gi nke i hurum di ebube, Kari ihu-n'anya ndinyom. 27 Ndi-dike esiwo aṅa da! Ihe-agha esiwo aṅa la n'iyì!

2 Samuel 2

1 O rue, ka nka gasiri, na Devid juru Jehova ese, si, M'gārigo n'otù nime obodo Juda? Jehova we si ya, Rigo. Devid we si, Òle ebe M'gārigo? Ọ si, Rue Hebron. 2 Devid we rigo n'ebe ahu, ya na ndinyom-ya abua kwa, bú Ahinoam nwayi Jezreel, na Abigail, bú nwunye Nebal onye Kamel. 3 Ndikom ndi ya na ha nọ ka Devid me-kwa-ra ka ha rigota, nwoke ọ bula na ulo-ya: ha we biri n'obodo nile nke Hebron. 4 Ndikom Juda we bia te Devid manu n'ebe ahu ibu eze ulo Juda. Ha we gosi Devid, si, Ndikom Jebesh-gilead bu ndi lìri Sọl. 5 Devid we zigara ndikom Jebesh-gilead ndi-ozi, si, ha, Ndi agọziri agọzi diri Jehova ka unu bu, na unu emeworo onye-nwe-unu, bú Sọl, ebere a, unu we líe-ya. 6 Ma ub͕u a Jehova mere unu ebere na ezi-okwu: ọzọ kwa, mu onwem gēmeghachiri unu ezi ihe a, n'ihi na unu emewo ihe a. 7 Ma ub͕u a ka aka-unu di ike, buru-kwa-nu ndi-dinkpà: n'ihi na onye-nwe-unu, bú Sọl, anwuwo; ọzọ kwa, mu ka ulo Juda teworo manu ibu eze-ha. 8 Ma Abnea nwa Nea, bú onye-isi usu-ndi-agha Sọl nwere, kuru Ish-boshet nwa Sọl, me ka ọ gabiga rue Mahanaim; 9 o we me ya eze Gilead, na nke ndi-Ashurait, na nke Jezreel, na nke Efraim, na nke Benjamin, na nke Israel nile. 10 (Ish-boshet nwa Sọl b͕ara ọgu arọ abua mb͕e ọ malitere ibu eze Israel, o we buru eze arọ abua. ) Otù ọ di, ulo Juda soro Devid. 11 Ọnu-ọgugu ubọchi Devid bu eze ulo Juda nime Hebron we di arọ asa na ọnwa isi. 12 Abnea nwa Nea, na ndi-orù Ish-boshet nwa Sọl, we si na Mahanaim puta rue Gibeon. 13 Joab nwa Zeruaia, na ndi-orù Devid, we pua, zute ha n'otù n'akuku ọdọ-miri Gibeon; ha we nọdu, ndi Devid n'otu akuku ọdọ-miri, na ndi Ish-boshet n'akuku nke-ọzọ nke ọdọ-miri. 14 Abnea we si Joab, Biko, ka umu-okorọbia bilie, me ihe-ọchì n'iru ayi. Joab we si, Ka ha bilie. 15 Ha we bilie gabiga n'ọnu-ọgugu; madu iri na abua diri Benjamin, di-kwa-ra Ish-boshet nwa Sọl, na madu iri na abua nime ndi-orù Devid. 16 Ha we jide, nwoke ọ bula o jide isi ibe-ya, we ma mma-agha-ya n'akuku ibe-ya; ha we dakọ n'otù: ewe kpọ aha ebe ahu Helkat-hazurim, nke di na Gibeon. 17 Agha we di ike nke-uku n'ubọchi ahu, ewe tib͕ue Abnea na ndikom Israel n'iru ndi-orù Devid. 18 Umu-ndikom Zeruaia atọ nọ kwa n'ebe ahu, bú Joab, na Abishai, na Asahel: ma ukwu Asahel di nfe n'ib͕a ọsọ dika otù nime mb͕ada nke di n'ọhia. 19 Asahel we chua Abnea n'azu; ma o sighi n'iso Abnea wezuga onwe-ya ije n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe. 20 Abnea we gha anya n'azu, si, Ọ̀ bu gi bu nka, Asahel? Ọ si, Mu ka ọ bu. 21 Abnea we si ya, Wezuga onwe-gi n'aka-nri-gi ma-ọbu n'aka-ekpe-gi, jidere onwe-gi otù nime umu-okorọbia, chiri n'onwe-gi ihe-ya i gāluta. Ma Asahel ekweghi isi n'iso ya wezuga onwe-ya. 22 Abnea we si kwa Asahel ọzọ, Si n'isom wezuga onwe-gi: nìhi gini ka m'gētib͕u gi rue ala? m'gēsi kwa aṅa weliere Joab nwa-nne-gi irum? 23 Ma ọ juru iwezuga onwe-ya: Abnea we were isi ube-ya tie ya n'okpuru ọgiriga-ya nke-ise, ube we puta n'azu ya, o we da n'ebe ahu, nwua n'okpuru ya: o rue, na ndi nile ndi biaruru ebe ahu, bú ebe Asahel dara nwua, guzoro. 24 Ma Joab na Abishai churu Abnea n'azu; anyanwu we da mb͕e ndi ahu biaruru ugwu ntà Ama, nke di n'iru Gia n'uzọ ọzara Gibeon. 25 Umu Benjamin we chikọta onwe-ha iso Abnea n'azu, ha we ghọ otù usu, guzo, n'elu otù ugwu ntà. 26 Abnea we kpọ Joab òkù, si, Ọ̀ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka mma-agha gēripia? ì maghi na ilu ka ọ gādi n'ikpe-azu? rù kwa ole mb͕e ka i nāgaghi-asi ndi-gi ka ha si n'iso umu-nne-ha laghachi? 27 Joab we si, Chineke nādi ndu, ọ buru na i kwughi, n'ezie mb͕e ahu site n'ututu ndim gārigowori, nwoke ọ bula site n'iso nwa-nne-ya. 28 Joab we fùa opì-ike, ndi-ya nile we guzo, ha achughi kwa Israel n'azu ọzọ, ha ebughi kwa agha ọzọ. 29 Ma Abnea na ndikom-ya jere ije n'Araba abali ahu nile; ha we gabiga Jọdan, je ije na Bitron nile, bia rue Mahanaim. 30 Joab we si n'iso Abnea lata: ọ we chikọta ndi-ya nile, ma agukọtara ndikom iri na iteghete na Asahel ndi nādighi n'etiti ndi-orù Devid. 31 Ma ndi-orú Devid tib͕uru ọgu ndikom iri-na-asatọ sitere na Benjamin, na n'etiti ndikom Abnea, ha we nwua. 32 Ha we bulie Asahel, lìe ya n'ílì nna-ya, nke di na Bet-lehem. Joab na ndikom-ya we je ije abali ahu nile, ìhè ututu we putara ha na Hebron.

2 Samuel 3

1 Agha ahu we di ogologo n'etiti ulo Sọl na ulo Devid: ma Devid di ike nāga n'iru, ma ulo Sọl enweghi ike nāla azu azu. 2 Ewe muara Devid umu-ndikom nime Hebron: ọkpara-ya bu Amnon, nke Ahinoam, bú nwayi Jezreel, muru; 3 nwa-ya nwoke nke-abua bu Kileab, nke Abigail nwunye Nebal, bú onye Kamel, muru; nke-atọ bu Absolom nwa Meaka nwa-nwayi Talmai, bú eze Geshua; 4 nke-anọ bu Adonaija nwa Hagit; nke-ise bu Shefataia nwa Abital; 5 nke-isi bu Itream, nke Egla nwunye Devid muru. Ndia ka amuru Devid nime Hebron. 6 O rue, mb͕e agha di n'etiti ulo Sọl na ulo Devid, na Abnea nēme onwe-ya ka ọ di ike n'ulo Sol. 7 Ma Sọl nwere iko-nwayi, aha-ya bu Rizpa, nwa-nwayi Aia. Ish-boshet we si Abnea, Gini mere i bakuru iko-nwayi nnam? 8 Iwe Abnea we di ọku nke-uku n'ihi okwu Ish-boshet, ọ si, Ọ̀ bu isi nkita nke ulo Juda nwere ka m'bu? Ta ka m'nēmere ulo Sọl, bú nna-gi, nēme-kwa-ra umu-nne-ya, nēme-kwa-ra ndi-eyì-ya, ebere, emeghkwam ka i rue Devid aka, ma i nēbom ebubo ajọ omume bayere nwayi a ta. 9 Chineke me Abnea otú a, me kwa ya ihe ọzọ otú a, ma asi na emereghm Devid ọbuná otú a, bú dika Jehova ṅuworo ya iyi; 10 ime ka ala-eze si n'ulo Sọl gabiga, na ime ka oche-eze Devid guzosie ike n'elu Israel na n'elu Juda, site na Dan we rue na Bia-sheba. 11 Ma ọ pughi izaghachi Abnea okwu ọzọ, n'ihi na ọ turu egwu ya. 12 Abnea we zigara Devid ndi-ozi n'ọnọdu ya, si, Ònye nwe ala? ọ si-kwa-ra, Ka mu na gi b͕a ndu, ma, le, akam gādiri gi, ime ka Israel nile chigharia biakute gi. 13 Ọ we si, Ọ di nma; mu onwem na gi gāb͕a ndu: nání, otù ihe ka mu onwem nāju n'aka-gi, si, I gaghi-ahu irum, ma ọ buru na i bughi uzọ me ka Maikal nwa Sọl bia, mb͕e i gābia ihu irum. 14 Devid we zigara Ish-boshet nwa Sọl ndi-ọzi, si, Nyem nwunyem, bú Maikal, onye m'ji ọgu api ise nke ndi Filistia lutara onwem. 15 Ish-boshet we ziga, nara ya n'aka di-ya, bú n'aka Paltiel nwa Laish. 16 Di-ya we soro ya je, nēje nākwa ákwá n'azu ya rue Bahurim. Abnea we si ya, Je, laghachi: o we laghachi. 17 Okwu Abnea we diyere ndi-okenye Israel, si, Na mb͕e gara aga unu nāchọ Devid ka ọ buru eze-unu: 18 Ma ub͕u a menu ya: n'ihi na Jehova ekwuwo okwu bayere Devid, si, M'gēwere aka Devid, bú orùm, zọputa ndim, bú Israel, n'aka ndi Filistia, na n'aka ndi-iro-ha nile. 19 Abnea kwu-kwa-ra na nti Benjamin: Abnea we je kwa ikwu na nti Devid nime Hebron ihe nile nke di nma n'anya Israel, na n'anya ulo Benjamin nile. 20 Abnea we biakute Devid rue Hebron, ya na orú ndikom. Devid we mere Abnea, me-kwa-ra ndikom soro ya, oké oriri. 21 Abnea we si Devid, Ka m'bilie je chikọtara onye-nwem, bú eze, Israel nile, ka gi na ha we b͕a ndu, ka i we buru kwa eze ndi nile nke nkpuru-obi-gi nāchọsi ike. Devid we zilaga Abnea, o we la n'udo. 22 Ma, le, ndi-orù Devid na Joab si n'usu ndi nāpunara madu ihe bia, ọ bu kwa ọtutu ihe-nkwata ka ha bubatara n'aka ha: ma Abnea anọyeghi Devid nime Hebron; n'ihi na o zilagawo ya, o we la n'udo. 23 Joab na usu-ndi-agha nile ndi soro ya we bia, ha we gosi Joab, si, Abnea nwa Nea biakutere eze, o we zilaga ya, o we la n'udo. 24 Joab we biakute eze, si, Gini ka i meworo? le, Abnea biakutere gi; n'ìhi gini ka nka bu, na i zilagawo ya, o we lasia? 25 I mawo Abnea nwa Nea, na ọ bu irafu gi ka ọ biara, ya na imara ọpupu-gi na nbata-gi, na imata ihe nile nke gi onwe-gi nēme. 26 Joab we si n'ebe Devid nọ puta, ziga ndi-ozi n'azu Abnea, ha we me ka o si n'olùlù-miri Saira biaghachi: ma Devid amaghi. 27 Abnea we laghachi rue Hebron, Joab we wezuga ya n'etiti ọnu-uzọ-ama ikpayere ya uka na nwayọ, o we tie ya n'okpuru ọgiriga-ya nke-ise n'ebe ahu, o we nwua n'ihi ọbara Asahel, bú nwa-nne-ya. 28 Devid we nu nke a mgbe emesiri, ọ si, Ndi puworo n'ọbara Abnea nwa Nea n'iru Jehova rue mb͕e ebighi-ebi ka mu na ala-ezem bu: 29 ka ọ dakwasi n'isi Joab, na n'ulo nna-ya nile; ka aghara kwa ibipu n'ulo Joab onye nwere orùrù n'anu-aru-ya, ma-ọbu onye-ekpenta, ma-ọbu onye nādabere na nkpa-n'aka, ma-ọbu onye nāda site na mma-agha, ma-ọbu onye nri kọrọ. 30 Ma Joab na Abishai, bú nwa-nne-ya, b͕uru Abnea, n'ihi na o mere ka nwa-nne-ha, bú Asahel, nwua nime Gibeon n'agha ahu. 31 Devid we si Joab, si kwa ndi nile ya na ha nọ, Dọwanu uwe-unu, ke ákwà-nkpe n'úkwù-unu, tie aka n'obi n'iru Abnea. Eze, bú Devid, nējeso kwa ihe eji ebu ozu. 32 Ha we lìe Abnea nime Hebron: eze we welie olu-ya kwa ákwà n'ílì Abnea; ndi Israel nile we kwa ákwà. 33 Eze we bùara Abnea abù-ákwà, si, Ọ̀ bu dika onye-nzuzu nānwu ka Abnea gānwu? 34 Ekeghi aka-gi abua ab͕u, emeghi kwa ka ukwu-gi abua biarue nso ihe ọla eji ke ukwu ab͕u: Dika onye nāda n'iru ndi ajọ omume, otú a ka i dara. Ndi Israel nile we kwara ya ákwá ọzọ. 35 Ndi ahu nile we bia ime ka Devid rie nri mb͕e ubọchi fọduru; ma Devid ṅuru iyi, si, Chineke mem otú a, me kwa ihe ọzọ otú a, ọ buru na edetum nri ọnu, ma-ọbu ihe ọ bula ọzọ, tutu ọdida-anyanwu. 36 Ndi-ya nile we mata, ọ di nma n'anya-ha: dika ihe ọ bula eze mere di nma n'anya ndi-ya nile. 37 Ndi-ya nile na Israel nile we mara n'ubọchi ahu na o siteghi n'aka eze ime ka Abnea nwa Nea nwua. 38 Eze we si ndi-orù-ya, Únu amaghi na onye-isi na onye uku adawo n'Israel ta? 39 Ma mu onwem akaghi aru ta, ọ bu ezie na abum onye etere manu ibu eze; ndikom ndia, bú umu Zeruaia, di kwa ike karim: Jehova kwughachi onye nēme ihe ọjọ dika ihe ọjọ ya si di.

2 Samuel 4

1 Ish-boshet nwa Sọl we nu na Abnea anwuwo nime Hebron, aka-ya we kuda, Israel nile ma-kwa-ra jijiji. 2 Ma Ish-boshet nwa Sọl nwere ndikom abua ndi bu ndi-isi usu ndi nāpunara madu ihe: aha otù bu Beana, aha nke-ọzọ bú Rikab, ha bu umu Rimon onye Beirot, sitere n'umu Benjamin: (n'ihi na anāgu-kwa-ra Benjamin, Beirot: 3 ndi Beirot we b͕alaga na Gitaim, buru ndi-ọbìa n'ebe ahu rue ta. ) 4 Ma Jonatan nwa Sọl nwere nwa-nwoke nke dara ngwurọ n'ukwu-ya abua. Ọ b͕ara arọ ise mb͕e akukọ Sọl na Jonatan siri na Jezreel bia, nwayi nāzù ya we kuru ya, b͕alaga: o rue, mb͕e ọ nēme ngwa ib͕alaga, na nwata ahu dara ada, we ghọ onye-ngwurọ. Aha-ya bu Mefiboshet. 5 Umu Rimon onye Beirot, bú Rikab na Beana, we je, biarue ulo Ish-boshet dika n'ikpo-ọku nke ehihie, ma ya onwe-ya nēdina ndina etiti-ehihie. 6 Ma n'ebe ahu ka ha biara rue etiti ulo, dika ha nēwere ọka wheat; ha we tie ya n'okpuru ọgiriga nke-ise: Rikab na Beana, bú nwa-nne-ya, we wepuga onwe-ha. 7 Ma mb͕e ha batara n'ulo, ka ya onwe-ya nēdina n'ihe-ndina-ya n'ime-ulo-ndina-ya, ha we tib͕ue ya, me ka ọ nwua, wezuga isi-ya, were isi-ya, je ije n'uzọ Araba abali ahu nile. 8 Ha we butere Devid isi Ish-boshet rue Hebron, si eze, Le, isi Ish-boshet nwa Sọl, bú onye-iro-gi, nke chọrọ ndu-gi; ma Jehova abọworo onye-nwem, bú eze, ọ́bọ̀ ta n'aru Sọl, na n'aru nkpuru ya. 9 Devid we za Rikab na Beana nwa-nne-ya, bú umu Rimon onye Beirot, si ha, Jehova nādi ndu, Onye b͕aputaworo nkpuru-obim na nkpab͕u nile, 10 mb͕e otù onye nēgosim, si, Le, Sọl anwuwo, ma onye ahu n'anya ya onwe-ya di ka onye nēzi ozi ọma, m'we jide ya, b͕ue ya na Ziklag, nka bu ihe m'nyere ya bayere ozi ọma ahu. 11 M'gēsi aṅa ghara ime kari otúa, mb͕e ndikom ndi nēmebi iwu b͕uworo onye ezi omume n'ulo-ya n'elu ihe-ndina-ya? Ma ub͕u a m'gaghi-ajuta ọbara-ya n'aka-unu kpochapu unu n'uwa? 12 Devid we nye umu-okorọbia-ya iwu, ha we b͕ue ha, bipu aka-ha na ukwu-ha, kwuba ha n'akuku ọdọ-miri nime Hebron. Ma ha were isi Ish-boshet, lìe ya n'ílì Abnea nime Hebron.

2 Samuel 5

1 Ebo Israel nile we biakute Devid rue Hebron, kwue, si, Le, ọkpukpu-gi na anu-aru-gi ka ayi bu. 2 Na mb͕e gara aga, mb͕e Sọl bu eze-ayi, gi onwe-gi bu onye nēdupu na onye nēdubata Israel: Jehova we si gi, Gi onwe-gi gāzù ndim, bú Israel onwe-gi gābu kwa onye-ndú Israel. 3 Ndi-okenye nile nke Israel we biakute eze rue Hebron; ha na eze, bú Devid, we b͕a ndu nime Hebron n'iru Jehova: ha we te Devid manu ibu eze Israel. 4 Onye b͕ara orú arọ na iri ka Devid bu mb͕e ọ malitere ibu eze, ọgu arọ abua ka ọ bu eze. 5 Na Hebron ka ọ bu eze Juda arọ asa na ọnwa isi: na Jerusalem ka ọ bu kwa eze Israel na Juda nile orú arọ na iri na atọ. 6 Eze na ndikom-ya we jerue Jerusalem jekuru ndi Jebus, bú ndi bi n'ala ahu: ha we gwa Devid okwu, si, I gaghi-abata n'ebe a, kama ndi-ìsì na ndi-ngwurọ gēme ka i wezuga onwe-gi: nāsi, Devid agaghi-abata n'ebe a. 7 Devid we were ebe ewusiri ike nke Zaion; nke ahu bu obodo Devid. 8 Devid we si n'ubọchi ahu, Onye ọ bula nke netib͕u ndi Jebus, ya jerue ebe miri si aga, we tib͕ue ndi-ngwurọ na ndi-ìsì, bú ndi nkpuru-obi Devid nākpọ asì. N'ihi nka ka ha nāsi, Ndi-ìsì na ndi-ngwurọ nọ; ọ gaghi-abà n. ulo. 9 Devid we biri n'ebe ahu ewusiri ike, o we kpọ ya obodo Devid. Devid we wue obodo gburugburu site na Milo we rue n'ime-ya. 10 Devid we nāga n'iru, nēje nādi uku; Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, nọye-kwa-ra ya. 11 Hairam, bú eze Taia, we zigara Devid ndi-ozi, na osisi cedar, na ndi-ọ̀kà n'osisi, na ndi-ọ̀kà na nkume: ha we wuere Devid ulo. 12 Devid we mara na Jehova emewo ya ka o guzosie ike ibu eze Israel, ọ ma-kwa-ra na O buliwo ala-eze-ya n'elu n'ihi ndi-Ya, bú Israel. 13 Devid we si na Jerusalem kuru ndi-iko nwayi na ndinyom ọzọ, mb͕e o siri na Hebron biasi: ewe muara Devid umu-ndikom na umu-ndinyom ọzọ 14 Ndia bu kwa aha ndi amuru ya na Jerusalem; Shamua, na Shobab, na Netan, na Solomon, 15 na Ibha, na Elishua; na Nefeg, na Jafia; 16 na Elishama, na Eliada, na Elifelet. 17 Ndi Filistia we nu na ha tere Devid manu ibu eze Israel, ndi Filistia nile we rigo ichọ Devid; Devid we nu ya, rida n'ebe ahu ewusiri ike. 18 Ma ndi Filistia biara, b͕asa onwe-ha na ndagwurugwu Refaim. 19 Devid we jua Jehova ase, si, M'gārigokuru ndi Filistia? Ì gēnye ha n'akam? Jehova we si Devid, Rigo: n'ihi na aghaghm inye ndi Filistia n'aka-gi. 20 Devid we biarue Beal-perazim, Devid we tib͕ue ha n'ebe ahu; o we si, Jehova ekwopuwo megide ndi-irom n'irum, dika nkwopu miri. N'ihi nka ka ọ kpọrọ aha ebe ahu Beal-perazim. 21 Ha we rapu arusi nile ha n'ebe ahu, Devid na ndikom-ya we chiri ha. 22 Ndi Filistia we rigo kwa ọzọ, b͕asa onwe-ha na ndagwurugwu Refaim. 23 Devid we jua Jehova ese, O si, Arigola: ga gburugburu rue n'azu ha, biakute ha na ncherita-iru osisi balsam. 24 O gēru kwa, mb͕e i nuru olu ikiti-ukwu n'elu osisi balsam ahu, mb͕e ahu ka i gēme ngwa: n'ihi na mb͕e ahu ka Jehova puworo n'iru gi itib͕u ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia. 25 Devid we me otú a, dika Jehova nyere ya iwu; o we tib͕ue ndi Filistia site na Geba rue ebe i nāba Gezea.

2 Samuel 6

1 Devid we chikọta kwa ndikom nile arọputara arọputa n'Israel, orú nnù madu uzọ atọ na nnù iri-na-ise. 2 Devid we bilie, si na Beale Juda je, ya na ndi Israel nile ndi ya na ha nọ, isi n'ebe ahu bugota ib͕e Chineke, nke akpọkwasiri Aha, bú aha Jehova nke usu nile nke ndi-agha Onye nānọkwasi cherubim. 3 Ha we me ka ub͕ọ-ala ọhu būru ib͕e Chineke, ha we buputa ya n'ulo Abinadab nke di n'ugwu ntà: Uza na Ahio, bú umu Abinadab, we nēdu ub͕ọ-ala ọhu ahu. 4 Ha we buputa ya n'ulo Abinadab nke di n'ugwu ntà, ya na ib͕e Chineke: Ahio we nēje n'iru ib͕e ahu. 5 Devid na ulo Israel nile nēgwu egwū n'iru Jehova, were ihe nile eji osisi fir me, were kwa ubọ-akwara, na une, na egwú-otiti, na castanet, na ájà. 6 Ha we biarue ebe-nzọcha-ọka Nakon, Uza we setia aka-ya rue ebe ib͕e Chineke di, jide ya, n'ihi na ehi nāb͕a ukwu. 7 Iwe Jehova we di ọku megide Uza; Chineke we tib͕ue ya n'ebe ahu n'ihi nmehie-ya; o we nwua n'ebe ahu n'akuku ib͕e Chineke. 8 Iwe Devid we di ọku n'ihi na Jehova tiwaputara ntiwa megide Uza: ọ we kpọ ebe ahu Perez-uza, rue ta. 9 Devid we tua egwu Jehova n'ubọchi ahu; ọ si, Ìb͕e Jehova gēsi aṅa biakutem? 10 Devid ekweghi kwa iwezugara onwe-ya ib͕e Jehova rue obodo Devid; ma Devid buzugara ya rue ulo Obed-edom, bú onye Gat. 11 Ib͕e Jehova we nọdu n'ulo Obed-edom, bú onye Gat, ọnwa atọ: Jehova we gọzie Obed-edom na ulo-ya nile. 12 Ewe gosi eze, bú Devid, si, Jehova agọziwo ulo Obed-edom na ihe nile o nwere, n'ihi ib͕e Chineke. Devid we were ọṅu je, si n'ulo Obed-edom bugota ib͕e Chineke n'obodo Devid. 13 O rue, mb͕e ndi nēbu ib͕e Jehova zọrọ nzọ-ukwu isi, na ọ churu ehi na nwa-ehi mara abuba n'àjà. 14 Devid were kwa ike-ya nile te egwún'iru Jehova; ewere ephod ákwà ọcha ke Devid n'ukwù. 15 Devid na ulo Israel nile we were iti-nkpu, were kwa olu opì-ike, nēbugota ib͕e Jehova. 16 O rue, mb͕e ib͕e Jehova batara n'obodo Devid, na Maikal nwa-nwayi Sọl lepuru anya na window, hu eze, bú Devid, ka ọ nāwuli, nēte kwa egwú, n'iru Jehova; o we leda ya anya n'obi-ya. 17 Ha we bubata ib͕e Jehova, guzo ya n'ọnọdu-ya, n'etiti ulo-ikwū nke Devid mara nye ya: Devid we sure àjà-nsure-ọku na àjà-udo n'iru Jehova. 18 Devid we surebìe àjà-nsure-ọku ahu na àjà-udo nile, gọzie ndi Israel n'aha Jehova nke usu nile nke ndi-agha. 19 O we kesara ndi Israel nile, bú ìgwè nile nke Israel, ma nwoke ma nwayi, madu ọ bula, otù ob͕e achicha, na otú ọkpurukpu anu, na otù mbadamba nkpuru-vine amiri ami. Ndi Israel nile we la, nwoke ọ bula n'ulo-ya. 20 Devid we lata igọzi ulo-yaz. Maikal, bú nwa-nwayi Sọl, we puta izute Devid, si, Le, otú eze Israel di nsọpuru nke-uku ta, onye kpupuru uwe n'aru-ya ta n'anya ndi-orù-nwayi nke ndi-orù-ya, dika otù nime ndikom efu nēkpupu uwe n'aru-ya ekpupu! 21 Devid we si Maikal, Ọ bu n'iru Jehova, Onye rọputaramn kari nna-gi, kari kwa ulo-ya nile, inyem iwu ibu onye-ndú ndi Jehova, bú Israel: m'we gwú egwu n'iru Jehova. 22 Ma m'gēweta-kwa-ra onwem nkọcha kari nka, m'gādi kwa ala n'anyam: ma ndi orù-nwayi ndi i kwuru okwu bayere ha, n'etiti ha ka agāsọpurum. 23 Ma Maikal, bú nwa-nwayi Sọl, o nweghi nwa rue ubọchi ọnwu-ya.

2 Samuel 7

1 O rue, mb͕e eze biri n'ulo-ya, mb͕e Jehova me-kwa-ra ka o zuru ike pua n'aka ndi-iro-ya nile buruburu, 2 na eze siri Netan, bú onye-amuma, Biko, le, Mu onwem nēbi n'ulo cedar, ma ib͕e Chineke nēbi n'etiti ákwà-nkwuba. 3 Netan we si eze, Ihe nile nke di n'obi-gi, je, me ya; n'ihi na Jehova nọyere gi. 4 O rue, n'abali ahu, na okwu Jehova ruru Netan nti, si, 5 Je, si orùm, bú Devid, Otú a ka Jehova siri, Ọ̀ bu gi onwe gi gēwurum ulo ibu ebe M'gēbi? 6 N'ihi na ebighm n'ulo site n'ubọchi M'mere ka umu Israel si n'Ijipt rigota, we rue ta, kama M'nējeghari n'ulo-ikwū na n'ebe-obibim. 7 N'ebe nile nke M'nējeghari n'etiti umu Israel nile, ọ̀ di okwu M'gwara otù n'ebo Israel nile, nke M'nyere iwu izù ndim, bú Israel, si, N'ìhi gini ka unu newurughm ulo cedar? 8 Ma ub͕u a, otú a ka i gāsi orùm, bú Devid, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Mu onwem siri n'ebe-ita-nri anu-ulo, si kwa n'ebe i nēso ìgwé ewu na aturu, kuru gi, ka i buru nye-ndú ndim, bú Israel: 9 M'we nọyere gi n'ebe ọ bula i jere, ebipu-kwa-ram ndi-iro-gi nile n'iru gi; M'gēme-kwa-ra gi aha uku, dika aha ndi uku ndi nọ n'uwa. 10 M'gēdo-kwa-ra ndim, bú Israel, otú ebe, ku kwa ha dika osisi, ka ha we biri n'ọnọdu-ha, ghara ima jijiji ọzọ; umu ajọ omume agaghi-eweda kwa ha ọzọ, dika na mbu, 11 na dika site n'ubọchi mb͕e M'nyere ndi-ikpe iwu ibu ndi-isi ndim, bú Israel; emewokwam ka i zuru ike pua n'aka ndi-iro-gi nile. Jehova egosiwo kwa gi na Jehova gēmere gi ulo. 12 Mb͕e ubọchi-gi zuru, mb͕e gi gēsoro nna-gi-hà dina kwa n'ọnwu, M'gēme kwa ka o bilie, bú nkpuru-gi nke gānọchi gi, nke gēsi n'afọ-gi puta, M'gēme kwa ka ala-eze-ya guzosie ike. 13 Onye ahu gēwuru aham ulo, M'gēme kwa ka oche-eze nke ala-eze-ya guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi. 14 Mu onwem gāburu ya nna, ya onwe ya gābu-kwa-ram nwa: ọ buru na ọ me ajọ omume, M'gēwere nkpa-n'aka madu, were kwa ihe-otiti nke umu madu, dua ya ọdu; 15 ma eberem agaghi-esi n'ebe ọ nọ wezuga onwe-ya, dika M'wēzugara ya n'ebe Sọl nọ, onye M'wezugara n'iru gi. 16 Ma ulo-gi na ala-eze-gi gēkwesi ntukwasi-obi n'iru gi rue mb͕e ebighi-ebi: agēme ka oche-eze-gi buru ihe guzosiri ike rue mb͕e ebighi-ebi. 17 Dika okwu ndia nile si di, na dika ọhù a nile si di, otú a ka Netan gwara Devid okwu. 18 Eze, bú Devid, we ba, nọdu ala n'iru Jehova; ọ si, Ònye ka m'bu, Onye-nwe-ayi Jehova, gini kwa ka ulom bu, na I mewo ka m'biarue na mb͕e a? 19 Ma nka bu nání ihe ntà n'anya-Gi, Onye-nwe-ayi Jehova; I we kwu kwa okwu bayere ulo-orú-Gi rue mb͕e di anya; nka bu kwa iwu bayere madu, Onye-nwe-ayi Jehova! 20 Ma gini ka Devid gāgwa kwa Gi ọzọ? n'ihi na Gi onwe-gi mara orù-Gi, Onye-nwe-ayi Jehova. 21 N'ihi okwughi, na dika obi-Gi si di, ka I meworo ihe-idi-uku a nile, ime ka orù-Gi mara ya. 22 N'ihi nka I di uku, Onye-nwe-ayi Jehova: n'ihi na ọ dighi onye di ka Gi, ọ dighi kwa Chineke ma-ọbughi Gi, dika ihe nile si di nke ayi nuworo na nti-ayi. 23 Ma òle mba di ka ndi-Gi, dika Israel, bú otù mba nke nēguzo iche n'uwa, nke Chineke jere ib͕aputara Onwe-ya ka ọ buru otù ndi, na imere Onwe-ya aha, na imere unu ihe-idi-uku a, na imere ala-Gi ihe di egwu, n'iru ndi-Gi, nke I siri n'Ijipt, bú mba di iche iche ọzọ na chi nile ha, baputara onwe-gi? 24 I we me ndi-Gi, bú Israel, ka o guzosiere Gi ike, iburu Gi otù ndi rue mb͕e ebighi-ebi; Gi onwe-gi, Jehova, we ghọrọ ha Chineke. 25 Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke, okwu ahu nke I kwuworo bayere orù-Gi, baye-kwa-ra ulo-ya, me ya ka o guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi, Gi me kwa dika I kwuworo. 26 Ka aha-Gi di kwa uku rue mb͕e ebighi-ebi, si, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu Chineke Israel: agēme kwa ka ulo orù-Gi, bú Devid, guzosie ike n'iru Gi. 27 N'ihi na Gi onwe-gi, Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke Israel, I kpughewo nti orù-Gi, si, M'gēwu-kwa-ra gi ulo: n'ihi nka orù-Gi nwetara obi-ike ikpere Gi ekpere a. 28 Ma ub͕u a, Onye-nwe-ayi Jehova, Gi onwe-gi bu Chineke onwe-ya, okwu-Gi nile bu kwa ezi-okwu, I gwawo kwa orù-Gi ezi ihe a: 29 ma ub͕u a kwere igọzi ulo orù-Gi, ka o we dirue mb͕e ebighi-ebi n'iru Gi: n'ihi na Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi Jehova, ekwuwo ya: ka ewere kwa ngọzi-Gi nāgọzi ulo orù-Gi rue mb͕e ebighi-ebi.

2 Samuel 8

1 O rue, mb͕e nka gasiri, na Devid tib͕uru ndi Filistia, me kwa ka ha ruru ala: Devid we nara n'aka ndi Filistia bridle nke isi obodo-ha. 2 O tib͕u-kwa-ra Moab, were udọ̀-ọtùtù tùa ha, me ha ka ha dina ala; o we tùa udọ̀-ọtùtù abua ime ka ha nwua, na udọ̀ ọtùtù zuru ezu ime ka ha di ndu. Moab we ghọrọ Devid ndi-orù, nēbute onyinye-inata-iru-ọma. 3 Devid tib͕u-kwa-ra Hedadeza nwa Rehob, bú eze Zoba, mb͕e ọ nēje iweghachi ike-ya n'akuku Osimiri. 4 Devid we napu n'aka-ya nnù ndi-inyinya anọ na ọgu ise, na orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri, bú ndi ji ukwu eje: Devid bipu-kwa-ra nkwonkwo-ukwu inyinya ub͕ọ-ala nile, ma o kwere ka ọgu inyinya ub͕ọ-ala ise fọdu n'etiti ha. 5 Siria Damaskọs we bia iyere Hedadeza, bú eze Zoba, aka, Devid we tib͕ue n'etiti ndi Siria orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri-na-ise. 6 Devid we tiye ebe-nguzo-ndi-agha nime Siria Damaskọs: Siria we ghọrọ Devid ndi-orú, nēbute onyinye-inata-iru-ọma. Jehova we nāzọputa Devid ebe ọ bula o jere. 7 Devid we chiri ọta ọla-edo nke dikwasiri ndi-orù Hedadeza, chita ha na Jerusalem. 8 Eze, bú Devid, we si na Beta, si kwa na Birotai, bú obodo Hedadeza, chiri ọtutu ọla nke-uku. 9 Toi, bú eze Hemat, we nu na Devid etib͕uwo usu-ndi-agha nile nke Hedadeza, 10 Toi we zíe Joram nwa-ya jekuru eze, bú Devid, iju ya ajuju bayere udo-ya, na igọzi ya, n'ihi na o busoworo Hedadeza agha, we tib͕ue ya: n'ihi na nwoke nke nēbuso Toi agha nke-uku ka Hadadeza bu. Ihe ọla-ọcha na ihe ọla-edo na ihe ọla di kwa n'aka Joram inye ya: 11 ihe ndia ka eze, bú Devid, do-kwa-ra nsọ nye Jehova, tiyere ọla-ọcha na ọla-edo nke o doro nsọ site na mba nile nke o budara; 12 site na Siria, site kwa na Moab, site kwa n'umu Amon, site kwa na ndi Filistia, site kwa n'Amalek, site kwa n'ihe-nkwata Hedadeza, nwa Rehob, bú eze Zoba. 13 Devid we mere onwe-ya aha mb͕e o siri n'itib͕u Siria nime Ndagwurugwu Nnù lata, bú orú nnù ndikom uzọ abua na nnù ise. 14 O tiye-kwa-ra ebe-nguzo-ndi-agha n'Edom: n'Edom nile ka o tiyere ebe-nguzo-ndi-agha, Edom nile we ghọrọ Devid ndi-orù. Jehova we nāzọputa Devid ebe ọ bula ọ jere. 15 Devid we buru eze Israel nile; Devid we nēmere ndi-ya nile ihe ekpere n'ikpe na ezi omume. 16 Joab nwa Zeruaia bu onye-isi usu-ndi-agha; Jehoshafat nwa Ahailud bu onye-ncheta: 17 Zedok nwa Ahaitub, na Ahimelek nwa Abaiata, bu ndi-nchu-àjà; Seraia bu ode-akwukwọ; 18 Benaia nwa Jehoiada bu onye-isi ndi Keret na ndi Pelet; umu-ndikom Devid bu ndi-isi n'ije ozi.

2 Samuel 9

1 Devid we si, Ọ̀ di onye ọ bula fọduru ọzọ nye ulo Sọl, ka m'we mere ya ebere n'ihi Jonatan? 2 Ulo Sọl nwere otù orù, aha-ya bu Ziba, ha we kpọ ya biakute Devid; eze we si ya, Gì onwe-gi bu Ziba? Ọ si, Orù-gi bu ya. 3 Eze we si, Ọ̀ dighi nwoke fọduru ulo Sọl ọzọ, ka m'we mere ya ebere Chineke? Ziba we si eze, Otù nwa-nwoke fọduru Jonatan, nke dara ngwurọ n'ukwu-ya abua. 4 Eze we si ya, Òle ebe ọ nọ? Ziba we si eze, Le, Onye ahu nọ n'ulo Makia nwa Amiel, nime Lodeba. 5 Eze, bú Devid, we ziga kuputa ya n'ulo Makia nwa Amiel, site na Lo-deba. 6 Mefiboshet, nwa Jonatan, nwa Sọl, we biakute Devid, da kpue iru-ya n'ala, kpọ isi ala. Devid we si, Mefiboshet, Ọ si, Le orù-gi! 7 Devid we si ya, Atula egwu; n'ihi na aghaghm imere gi ebere n'ihi Jonatan, bú nna-gi, m'gēweghachi-kwa-ra gi ubi nile nke Sọl nna-gi; gi onwe-gi gēri kwa nri na table nkem mb͕e nile. 8 Ọ kpọ isi ala, si, Gini ka orù-gi bu, na i gēche iru n'ebe nkita nwuru anwu dikam nọ? 9 Eze we kpọ Ziba, onye buri nwa-okorọbia Sọl, si ya, Ihe nile Sọl na ulo-ya nile nwere ka m'nyeworo nwa onye-nwe-gi. 10 I gālu-kwa-ra ya ọlu ala-ubi, gi onwe-gi, na umu-gi ndikom, na ndi-orù-gi; i gēwebata kwa nkpuru ọ miri, ka nwa onye-nwe-gi we nwe nri ọ gēri: ma Mefiboshet nwa onye-nwe-gi gēri nri na table nkem mb͕e nile. Ma Ziba nwere umu-ndikom iri na ise na orú ndi-orù. 11 Ziba we si eze, Dika ihe nile si di, nke onye-nwem, bú eze, nyere orù-ya n'iwu, otú a ka orù-gi gēme. Eze we si, Ma Mefiboshet ganēri ihe na table nkem, dika otù nime umu eze. 12 Mefiboshet nwe-kwa-ra otù nwatakiri-nwoke, aha-ya bu Maika. Ma ndi nile ndi bi n'ulo Ziba buru Mefiboshet ndi-orù. 13 Mefiboshet we biri na Jerusalem' n'ihi na ọ bu na table eze ka ọ nēri ihe mb͕e nile; ma ya onwe-ya dara ngwurọ n'ukwu-ya abua.

2 Samuel 10

1 O rue, mb͕e ihe a gasiri, na eze umu Amon nwuru, Hanun nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya. 2 Devid we si, M'gēmere Hanun nwa Nehash ebere, dika nna-ya merem ebere. Devid we ziga ikasi ya obi bayere nna-ya site n'aka ndi-orú-ya. Ndi-orù Devid we ba n'ala umu Amon. 3 Ma ndi-isi umu Amon siri Hanun, bú onye-nwe-ha, Devid, ọ́ nāsọpuru nna-gi n'anya-gi, na o ziteworo gi ndi-nkasi-obi? ọ̀ bughi ileputa obodo a, na iledo ya, na ikwatu ya, ka Devid zitere ndi-orù-ya ibiakute gi? 4 Hanun we were ndi-orù Devid, kọpu nkera nke afu-ọnu-ha, bipu kwa uwe-nwuda-ha n'etiti, rue otule-ha, we zilaga ha. 5 Ha we gosi Devid, o ziga izute ha; n'ihi na ihere nēme ndikom ahu nke-uku. Eze we si, Nọdunu na Jeriko rue mb͕e afu-ọnu-unu tolitere, mb͕e ahu ka unu gālata. 6 Umu Amon we hu na ha nēsì Devid ísì ọjọ, umu Amon we ziga, go Siria Bet-rehob na Siria Zoba, orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri ndi ji ukwu eje, na eze Meaka, ya na nnù ndikom abua na ọgu iri, na ndikom Tob, bú orú nnù ndikom na nnù iri. 7 Devid we nu ya, ziga Joab, na usu-ndi-agha nile, bú ndi-dike. 8 Umu Amon we puta, do agha n'usoro n'oghere ọnu-uzọ-ama: Siria Zoba, na Rehob, na ndikom Tob, na Meaka, nọrọ onwe-ha n'ọhia. 9 Joab we hu na iru agha ahu di megide ya iru na azu, o we rọputa ufọdu n'etiti ndi nile arọputara arọputa n'Israel, do ha n'usoro izute Siria: 10 o tiye ndi Israel fọduru n'aka Abishai, bú nwa-nne-ya, we do ha n'usoro izute umu Amon. 11 Ọ si, Ọ buru na Siria akariam ike, i gābu-kwa-ram onye-nzọputa: ma ọ buru na umu Amon akaria gi ike, m'gābia kwa izọputa gi. 12 Di ike, ka ayi me kwa onwe-ayi ndi di ike n'ihi ndi-ayi, na n'ihi obodo nile nke Chineke-ayi: Jehova me kwa ihe di nma n'anya-Ya. 13 Joab na ndi soro ya we biarue agha ahu nso imegide Siria: ha we b͕alaga n'iru ya. 14 Umu Amon we hu na Siria ab͕alagawo, ha onwe-ha we b͕alaga kwa n'iru Abishai, ba n'obodo. Joab we si n'ebe umu Amon nọ lata, biarue Jerusalem. 15 Siria we hu na etib͕uru ha n'iru Israel, ha we chikọta onwe-ha n'otù. 16 Hedareza we ziga, me ka Siria ndi nọ n'ofè Osimiri puta: ha we biarue Hilam, Shobak onye-isi usu-ndi-agha Hedareza je-kwa-ra n'iru ha. 17 Ewe gosi Devid; o we chikọta Israel nile, gabiga Jọdan, biarue Hilam. Siria we do onwe-ha n'usoro izute Devid, ha we buso ya agha. 18 Siria we b͕alaga n'iru Israel; Devid we b͕ue n'etiti ndi Siria ndikom nke nnù ub͕ọ-ala na ọgu iri-na-ise, na orú nnú ndi-inyinya uzọ ise; o tib͕u-kwa-ra Shobak, bú onye-isi usu-ndi-agha-ha, o we nwua n'ebe ahu. 19 Eze nile, bú ndi-orù Hedareza, we hu na etib͕uru ha n'iru Israel, ha we me ka ha onwe-ha na Israel di n'udo, we fè ha òfufè. Siria we tua egwu izọputa umu Amon ọzọ.

2 Samuel 11

1 O rue, n'ọb͕ub͕a arọ, na mb͕e ndi-eze nāpu ibu agha, na Devid zigara Joab, ya na ndi-orù-ya, na Israel nile; ha we bibie umu Amon, nọchigide kwa Raba n'agha. Ma Devid nānọdu na Jerusalem. 2 O rue, na mb͕e anyasi, na Devid siri n'ihe-ndina-ya bilie, jegharia n'elu ulo eze: o we si n'elu ulo ahu hu otù nwayi ka ọ nāsa aru: ma nwayi ahu di nma nke-uku n'ile anya. 3 Devid we zìe jua ajuju bayere nwayi ahu. Otù onye we si, Nwayi a, ọ̀ bughi Bat-sheba, nwa-nwayi Eliam, bú nwunye Urai onye Het? 4 Devid we ziga ndi-ozi, kuru ya; nwayi ahu we biakute ya, ya na ya we dina; (ma nwayi ahu si n'ọrurú-ya nēdo onwe-ya nsọ, ) o we laghachi n'ulo-ya. 5 Nwayi ahu we turu ime; o zìe, gosi Devid, si, Mu onwem di ime. 6 Devid we zigara Joab ozi, si, Ziterem Uraia onye Het. Joab we zigara Devid Uraia. 7 Uraia we biakute ya, Devid we jua ya ajuju bayere udo Joab, baye-kwa-ra udo ndi Israel, na otú agha nāga. 8 Devid we si Uraia, Rida n'ulo-gi, sa ukwu-gi. Uraia we si n'ulo eze pua, onyinye nri eze nyere ya we puso ya n'azu. 9 Ma Uraia dinara n'ọnu-uzọ ulo eze n'etiti ndi-orù nile nke onye-nwe-ya, ọ ridaghi kwa rue ulo-ya. 10 Ha we gosi Devid, si, Uraia aridaghi rue ulo-ya. Devid we si Uraia, Ọ̀ bughi n'ije ka gi onwe-gi si bia? gini mere i ridaghi rue ulo-gi? 11 Uraia we si Devid, Ib͕e Chineke, na Israel, na Juda, nānọdu n'ulo-ntu; onye-nwem Joab na ndi-orù onye-nwem nānọ kwa n'ulo-ikwū n'ọhia; ma mu onwem, m'gābà n'ulom, iri ihe na iṅu ihe-ọṅuṅu, na isoro nwunyem dina? ndu-gi, na ndu nkpuru-obi-gi, ma ọ buru na emem ihe a. 12 Devid we si Uraia, Nọdu kwa n'ebe a ta, echi ka m'gezilaga kwa gi. Uraia we nọdu na Jerusalem ubọchi ahu na echi-ya. 13 Devid we kpọ ya, o we rie ihe n'iru ya, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu; Devid we me ya ka ọ ṅubiga manya okè: o we pua n'anyasi idina n'ihe-ndina-ya n'etiti ndi-orù onye-nwe-ya, ma ọ ridaghi rue ulo-ya. 14 O rue, n'ututu, na Devid degara Joab akwukwọ, we ziga ya site n'aka Uraia. 15 O we de n'akwukwọ ahu, si, Donu Uraia na ncherita-iru agha ahu nke siri ike kari, sinu n'iso ya la azu, ka ewe tib͕ue ya, o we nwua. 16 O rue, mb͕e Joab nēche obodo nche, na o tiyere Uraia n'ebe ọ mara na ndikom bu dì-nkpà nọ. 17 Ndikom obodo we pua, buso Joab agha: ufọdu n'etiti ndi Israel we da, bú n'etiti ndi-orù Devid; Uraia onye Het nwu-kwa-ra. 18 Joab we ziga gosi Devid ihe nile emere n'agha ahu; 19 o we nye onye-ozi iwu, si, Mb͕e i gwabìri eze okwu agha nile, 20 o gēru kwa, ọ buru na ọnuma nke eze ebilie, o we si gi, Gini mere unu jeruru obodo ahu nso ibu agha? ùnu amaghi na ha gēsi na mb͕idi b͕a uta? 21 ònye tib͕uru Abimelek nwa Jerubeshet? nwàyi esighi na mb͕idi tua aka-nkume n'isi-ya, o we nwua na Tibez? n'ìhi gini ka unu jeruru mb͕idi nso? i gāsi kwa, Orù-gi bú Uraia onye Het, anwuwo kwa. 22 Onye-ozi ahu we je, bata, gosi Devid ihe nile Joab ji zìe ya. 23 Onye-ozi ahu we si Devid, Ndikom ahu di ike imegide ayi, we pukute ayi rue ọhia, ayi we bugide ha agha rue oghere ọnu-uzọ-ama. 24 Ndi-ọb͕a-uta we si na mb͕idi nāb͕a ndi-orù-gi uta; ufọdu n'etiti ndi-orù eze we nwua, orù-gi, bú Uraia onye Het, anwuwo kwa. 25 Devid we si onye-ozi ahu, Otú a ka i gāsi Joab, Ka ihe a ghara ijọ njọ n'anya-gi, n'ihi na mma-agha nēripia otù onye dika ọ nēripa onye ọzọ: me ka agha-gi di ike megide obodo ahu, kwadà ya: gi me kwa ka ọ di ike. 26 Nwunye Uraia we nu na Uraia, bú di-ya, anwuwo, o we tiere di-ya aka n'obi. 27 Iru-újú ahu we gabiga, Devid we ziga, webata ya n'ulo-ya, o we ghọrọ ya nwunye, muara ya nwa. Ma ihe Devid mere jọrọ njọ n'anya Jehova.

2 Samuel 12

1 Jehova we zìe Netan jekuru Devid. O we biakute ya, si ya, Ndikom abua di n'otù obodo; otù bu ọgaranya, nke-ọzọ bu ob͕eye. 2 Ọgaranya ahu nwere ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi bara uba nke-uku. 3 Ma ob͕eye ahu enweghi ihe ọ bula, ma-ọbughi otù nwa-nne-aturu ntà, nke ọ zutara debe ya ndu: o we nọyere ya, nọye-kwa-ra umu-ya, tolite; n'iberibe ihe-oriri-ya ka ọ nēri, n'iko-ya ka ọ nāṅu kwa, n'obi-ya ka o nēdina kwa, o we ghọrọ ya nwa-nwayi. 4 Onye-ije we biakute ọgaranya ahu, o we rapu iwere anu n'etiti ìgwè ewu na aturu-ya ma-ọbu n'etiti ìgwè ehi-ya, idoziri onye-ije ahu nke biakutere ya, ma o were nwa-nne-aturu nke ob͕eye, doziere nwoke ahu biakutere ya. 5 Iwe Devid we di ọku nke-uku megide nwoke ahu; o we si Netan, Jehova nādi ndu, n'ezie onye kwesiri ọnwu ka nwoke ahu bu nke nēme ihe a: 6 ma nwa-nne-aturu ahu, ọ gākwughachi kwa ya ob͕eye ahu okpukpu anọ, n'ihi na o mere ihe a, na n'ihi na o nweghi ọmiko. 7 Netan we si Devid, Gi onwe-gi ka nwoke ahu bu. Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Mu onwem tere gi manu ibu eze Israel, Mu onwem naputa-kwa-ra gi n'aka Sọl; 8 M'we nye gi ulo onye-nwe-gi, na ndinyom onye-nwe-gi n'obi-gi, nye kwa gi ulo Israel na nke Juda; ma ọ buru na nke ahu di ntà, M'gātukwasi-kwa-ra gi otú a na otú a. 9 Gini mere i ji lelì okwu Jehova, ime ihe jọrọ njọ n'anya-Ya? i werewo mma-agha tib͕ue Uraia onye Het, nwunye-ya ka i werewo-kwa-ra n'onwe-gi na nwunye; ma ya onwe-ya, i werewo mma-agha umu Amon b͕ue ya. 10 Ma ub͕u a mma-agha agaghi-ewezuga onwe-ya n'ulo-gi rue mb͕e ebighi-ebi; n'ihi na i lelìwom, we kuru nwunye Uraia onye-Het ka ọ ghọrọ gi nwunye. 11 Otú a ka Jehova siri, Le, M'nēme ka ihe ọjọ si n'ulo-gi bilie imegide i, M'gāchiri kwa ndinyom-i n'anya-gi nye ibe-gi, ọ gēso kwa ndinyom-i dina n'anya anyanwu a. 12 N'ihi na gi onwe-gi mere ya na nzuzo: ma Mu, onwem gēme ihe a n'iru Israel nile, na n'iru anyanwu. 13 Devid we si Netan, Emehiewom megide Jehova. Netan we si Devid, Jehova emewo kwa ka nmehie-gi gabiga; i gaghi-anwu. 14 Otú ọ di, n'ihi na i mewo ka ndi-iro Jehova kpọlu nkpọlu nke-uku n'okwu a, nwa-nwoke nke amuru gi aghaghi inwu kwa. 15 Netan we la n'ulo-ya. Jehova we tie nwata ahu ihe-otiti, bú nke nwunye Uraia muru nye Devid, o we nāria ọria nke-uku. 16 Devid we riosie Chineke aririọ ike bayere nwata ahu; Devid we nēbu ọnu, ba nime, dina ala ogologo abali nile. 17 Ndi-okenye ulo-ya we bilie n'akuku ya, ime ka o si n'ala bilie: ma o kweghi, o soghi kwa ha ri nri. 18 O rue, n'ubọchi nke-asa, na nwa ahu nwuru. Ndi-orù Devid we tua egwu igosi ya na nwa ahu anwuwo: n'ihi na ha siri, Le, mb͕e nwa ahu nọ na ndu, ayi gwara ya okwu, ma o geghi nti n'olu-ayi: àyi gēsi kwa aṅa si ya, Nwa ahu anwuwo, o we me onwe-ya ihe ọjọ? 19 Devid we hu na ndi-orù-ya nātakwurita onwe-ha, Devid we mata na nwa ahu anwuwo: Devid we si ndi-orù-ya, Nwa ahu, ọ̀ nwuwo? Ha si, Ọ nwuwo. 20 Devid we si n'ala bilie, sa aru, te onwe-ya manu, b͕anwe uwe-nb͕okwasi-ya; o we ba n'ulo Jehova, kpọ isi ala: o we ba n'ulo-ya, jua ha, ha we d-oba nri n'iru ya, o rie. 21 Ndi-orù-ya we si ya, Gini bu ihe a nke i meworo? ọ bu n'ihi nwa ahu, mb͕e ọ nọ na ndu, ka i būru ọnu, kwa ákwá; ma mb͕e nwa ahu nwuru, i biliri rie nri. 22 Ọ si, Mb͕e nwa ahu nọ na ndu, eburum ọnu, kwa ákwá' n'ihi na m'siri, Ònye mara? eleghi anya Jehova gēmerem amara, ka nwa ahu we di ndu. 23 Ma ub͕u a ọ nwuwo, n'ìhi gini kwa ka mu onwem gēbu ọnu? àpurum iweghachi ya ọzọ? Mu onwem nālakuru ya, ma ya onwe-ya agaghi-alaghachikutem. 24 Devid we kasie Bat-sheba, bú nwunye-ya, obi, we bakuru ya, ya na ya we dina: o we mua nwa-nwoke, Devid we kpọ aha-ya Solomon. Jehova we hu ya n'anya; 25 O we zìe site n'aka Netan, bú onye-amuma, kpọ aha-ya Jedidaia, n'ihi Jehova. 26 Ma Joab busoro Raba nke umu Amon agha, were obodo eze. 27 Joab we zigara Devid ndi-ozi, si, Ebusowom Raba agha, ewerewokwam obodo miri. 28 Ma ub͕u a, chikọta ndi Israel fọduru, ma kwa ulo-ikwū-gi megide obodo ahu, were ya; ka mu onwem ghara iwere obodo ahu, ewe kpọkwasi ya aham. 29 Devid we chikọta ndi Israel nile, jerue Raba, buso ya agha, were ya. 30 O we kpupu okpu-eze nke eze-ha n'isi-ya; ọtùtù-ya bu otù talent ọla-edo, nkume di oké ọnu-ahia di kwa ya; o we di n'isi Devid. O weputa-kwa-ra ihe-nkwata obodo ahu, nke riri nne nke-uku. 31 O me-kwa-ra ka ndi nọ nime ya puta, o tiye ha n'okpuru mma-nkwọ, na n'okpuru ígwè nēbì ihe, na n'okpuru anyu-ike ígwè, me kwa ka ha gabiga n'ihe eji akpu brick: otú a ka ọ nēme kwa obodo nile nke umu Amon. Devid na ndi Israel nile we lata na Jerusalem.

2 Samuel 13

1 O rue, mb͕e nka gasiri, na Absalom nwa Devid nwere nwa-nne-nwayi mara nma, aha-ya bu Tema; Amnon nwa Devid we hu ya n'anya. 2 O we di Amnon nkpà otú a, na o mere onwe-ya onye aru nādighi ike n'ihi Tema, bú nwa-nne-ya; n'ihi na nwa-ab͕oghọ nāmaghi nwoke ka ọ bu; o we di ike n'anya Amnon ime ya ihe ọ bula. 3 Ma Amnon nwere otù eyì, aha-ya bu Jonadab, nwa Shimea nwa-nne Devid: ma Jonadab bu nwoke mara ihe nke-uku. 4 O we si ya, Gini mere gi onwe-gi nāta aru otú a kwa-ututu, gi nwa eze? ì gaghi-egosim? Amnon we si ya, Tema, bú nwa-nne-nwayi Absalom nwa-nnem, ka mu onwem nāhu n'anya. 5 Jonadab we si ya, Dinakwasi n'ihe-ndina-gi, me onwe-gi onye aru nādighi ike: ma mb͕e nna-gi batara ihu gi, i gāsi ya, Biko, ka Tema, bú nwa-nnem, bata, ka o me kwa ka m'rie nri, ka o dozi kwa ihe-oriri ahu n'anyam, ka m'we hu ya, rie ya n'aka-ya. 6 Amnon we dina, mee onwe-ya onye aru nādighi ike: eze we bata ihu-ya, Amnon we si eze, Biko, ka Tema, bú nwa-nnem, bata, me achicha abua n'anyam, ka m'we rie ha n'aka-ya 7 Devid we zigara Tema ozi n'ulo, si, Biko, je n'ulo Amnon nwa-nne-gi, doziere ya ihe-oriri. 8 Tema we je n'ulo Amnon nwa-nne-ya; ma onye ahu nēdina edina. O we were utu ọka flour agwọrọ agwọ, gwọ ya, me achicha n'anya-ya, sie achicha ahu. 9 O were ite, wupu ha n'iru ya; ma ọ juru iri ha. Amnon we si, Me ka madu ọ bula si n'ebe m'nọ pua. Ha we pua, madu ọ bula, n'ebe ọ nọ. 10 Amnon we si Tema, Bubata ihe-oriri n'ime-ulo, ka m'we rie ya n'aka-gi. Tema we chiri achicha nke o mere, chitara Amnon nwa-nne-ya n'ime-ulo. 11 Ọ chita ha nso ya ka o rie, Amnon we jide ya, si ya, Bia, sorom dina, nwa-nnem. 12 Ọ si ya, É-è nwa-nnem, ewedalam n'ala; n'ihi na adighi-eme otú a n'Israel: emela ihe-nzuzu a. 13 Ma mu onwem, òle ebe m'gēme ka ita-utam la? ma gi onwe-gi, i gādi ka otù onye nime ndi-nzuzu n'israel. Ma ub͕u a, biko, gwa eze okwu; n'ihi na ọ gaghi-eb͕ochim n'ebe i nọ. 14 Ma ọ kweghi ige nti olu-ya: ọ di kwa ike kari ya, ọ we weda ya n'ala, soro ya dina. 15 Amnon we kpọ ya asì, bú ikpọ-asì di uku ri nne; n'ihi na ikpọ-asì ọ kpọrọ ya di uku kari ihu-n'anya ọ huru. Amnon we si ya, Bilie, la. 16 Ọ si ya, Emela otú a, n'ihi na ihe ọjọ uku a n'izilagam jọrọ njọ kari nke-ọzọ nke i merem. Ma o kweghi ige ya nti. 17 O we kpọ nwa-okorọbia-ya nke nejere ya ozi, si, Biko, si n'ebe m'nọ chupu nwayi a n'èzí, kpachie uzọ n'azu ya. 18 Ma uwe-nwudaa nwere aka di n'aru ya: n'ihi na uwe-nwuda di otú a ka umu-ndinyom eze ndi nāmaghi nwoke nēyi. Onye nējere ya ozi we me ka ọ pua n'èzí, we kpachie uzọ n'azu ya. 19 Tema we būru ntu n'isi-ya dọwa uwe-nwuda nwere aka nke di n'aru ya; ọ tukwasi aka-ya n'isi-ya, we la, nēje nēti nkpu. 20 Absalom, bú nwa-nne-ya, we si ya, Amnon nwa-nne-gi, ò sorowo gi dina? ma ub͕u a, nwa-nnem, b͕a nkiti: nwa-nne-gi ka ọ bu; atukwasila obi-gi n'ihe a. Tema we nọdu dika nwayi arapuru nání ya, n'ulo Absalom nwa-nne-ya. 21 Ma eze, bú Devid, nuru ihe ndia nile, iwe-ya we di ọku nke-uku. 22 Ma Absalom agwaghi Amnon okwu ọ bula ma ọ bu nke di njọ ma-ọbu nke di nma: n'ihi na Absalom kpọrọ Amnon asì. n'ihi na ọ wedara Tema nwa-nne-ya n'ala. 23 O rue, mb͕e arọ abua zuru ezu gasiri, na Absalom nwere ndi nākpacha aji anu na Beal-hezoa, nke di n'akuku Efraim: Absalom we kpọ umu-ndikom eze nile. 24 Absalom we biakute eze, si, Biko, le, Orù-gi nwere ndi nākpacha aji anu; biko, ka eze na ndi-orù-ya soro orù gi je. 25 Eze we si Absalom, É-è, nwam, biko, emela ka ayi nile je, ka ayi we ghara ibu edi arọ́ n'isi gi. O rugid ya: ma o kweghi ije, ma ọ gọziri ya. 26 Absalom we si, Ma ọ buru na i jeghi, biko, ka Amnon nwa-nnem soro ayi je. Eze we si ya, Nìhi gini ka ọ gēsoro gi je? 27 Absalom we rugide ya, o we zie Amnon na umu-ndikom eze nile ka ha soro ya je. 28 Absalom we nye ndi-orù-ya iwu, si, Biko, lezienu anya. mb͕e obi Amnon di nma na manya-vine; mb͕e m'si kwa unu, Tibuenu Amnon, menu ka ọ nwua, unu atula egwu: ọ̀ bughi na mu onwem enyewo unu iwu? dinu ike, buru-kwa-nu ndi-dìnkpà. 29 Umu-okorọbia Absalom we me Amnon dika Absalom nyere iwu. Umu-ndikom eze nile we bilie, rikwasi, nwoke ọ bula n'elu inyinya mule-ya, ha we b͕alaga. 30 O rue, mb͕e ndi ahu nọ n'uzọ, na akukọ ahu biaruru Devid nti, si, Absalom eb͕uwo umu-ndikom eze nile, ọ dighi kwa otù onye fọduru nime ha. 31 Eze we bilie, dọwa uwe-ya nile, dina n'ala; ndi-oru-ya nile nēguzo kwa, ha na uwe-ha dọwara adọwa. 32 Jonadab, nwa Shimea nwa-nne Devid, we za, si, Ka onye-nwem ghara isi na emewo ka umu-okorọbia nile, bú umu eze, nwua; n'ihi na Amnon, nání ya, nwuru anwu: n'ihi na edoro nka n'okwu-ọnu Absalom site n'ubọchi o wedara Tema nwa-nne-ya n'ala. 33 Ma ub͕u a ka onye-nwem, bú eze, ghara ido okwu a n'obi-ya, si, Umu-ndikom eze nile anwuwo, n'ihi na Amnon, nání ya, nwuru anwu. 34 Absalom we b͕alaga. Nwa-okorọbia nke nēche nche we welie anya-ya hu, ma, le, ndi riri nne nābia site n'uzọ akuku ugwu di n'azu ya. 35 Jonadab we si eze, Le, umu-ndikom eze abiawo: dika okwu orù-gi kwuru, otú a ka ọ di. 36 O rue na, mb͕e o kwubìri okwu, le, umu-ndikom eze biara, welie olu-ha, kwa ákwá: ọzọ kwa eze na ndi-orù-ya nile kwara ákwá di uku ri nne. 37 Ma Absalom b͕alagara jekuru Talmai nwa Amihua, eze Geshua. Devid we nēru újú nwa-ya ubọchi nile. 38 Absalom we b͕alaga, jerue Geshua, nọ n'ebe ahu arọ atọ. 39 Agu nāgusi nkpuru-obi Devid, bú eze, ike ipukuru Absalom: n'ihi na akasiri ya obi bayere Amnon, n'ihi na ọ nwuwo.

2 Samuel 14

1 Joab nwa Zeruaia we mara na obi eze di n'ebe Absolom nọ. 2 Joab we ziga ozi na Tekoa, si n'ebe ahu kuta otù nwayi mara ihe, si ya, Biko, me onwe-gi onye nēru újú biko, yiri kwa uwe iru-újú, ete-kwa-la onwe-gi manu, kama di ka nwayi nke nēru újú ọtutu ubọchi ndia n'ihi onye nwuru anwu: 3 i gābakuru kwa eze, gwa ya okwu dika okwu a si di. Joab we tiye okwu n'ọnu-ya. 4 Nwayi Tekoa we gwa eze okwu, da kpue iru-ya n'ala, kpọ isi ala, si, Zọputam eze. 5 Eze we si ya, Gini nēme gi? Ọ si, n'ezie nwayi di-ya nwuru ka m'bu, dim anwuwo kwa. 6 Nwayi nējere gi ozi nwe-kwa-ra umu-ndikom abua, ha abua we lua ọ̀gù n'ọhia, ọ dighi kwa onye-nnaputa n'etiti ha, ma otù onye tib͕uru ibe-ya, me ka ọ nwua. 7 Ma, le, ab͕uru-ha nile ebiliwo megide nwayi nējere gi ozi, ha we si, Nye ayi onye tib͕uru nwa-nne-ya, ka ayi we me ka ọ nwua n'ọnodu ndu nwa-nne-ya onye o b͕uru, ayi gēkpochapu kwa onye-nnweta ahu: ma ha gēmenyu icheku nkem nke fọduru, we ghara idoro dim aha ma-ọbu ndi fọduru n'elu uwa. 8 Eze we si nwayi ahu, La n'ulo-gi, mu onwem gēnye kwa iwu bayere gi. 9 Nwayi Tekoa ahu we si eze, N'isim, onye-nwem, eze, ka ajọ omume a di, na n'isi ulo nnam: ma ka eze na oche-eze-ya buru ndi ikpe nāmaghi. 10 Eze we si, Onye nāgwa gi okwu, me ka ọ biakutem, ọ gaghi-emetu kwa gi aka ọzọ. 11 Nwayi ahu we si, Biko, ka eze cheta Jehova, bú Chineke-gi, ka onye-ọ́bọ̀ ọbara ghara ibibi nke-uku, ka ha we ghara ikpochapu nwam nwoke. Devid we si, Jehova nādi ndu, ọ dighi otù nime agiri-isi nwa-gi gāda n'ala. 12 Nwayi ahu we si, Biko, ka nwayi nējere gi ozi gwa onye-nwem, bú eze, okwu. Ọ si, kwue. 13 Nwayi ahu we si, Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka i chère ihe di otú a megide ndi Chineke? n'ihi na eze nēkwu okwu a dika onye ikpe mara, ebe eze nādighi-eme ka onye nke ya achupuru achupu lata. 14 N'ihi na ayi aghaghi inwu, ayi di kwa ka miri nke anāwusi n'ala, nke anāgaghi-achikọta; ma Chineke ewepughi ndu, kama Ọ nēchè èchìchè, ka onye achupuru achupu we ghara ibu onye achupuru n'ebe Ọ nọ. 15 Ma ub͕u a, ebe m'biaworo igwa eze, bú onye nwem, okwu a, ọ bu n'ihi na ndim emewo ka m'tua egwu; nwayi nējere gi ozi we si, Biko, ka m'gwa eze okwu; eleghi anya eze gēme okwu nke orù-ya nwayi. 16 N'ihi na eze gānu, inaputa orù-ya nwayi n'ọbu-aka nwoke nāchọ ikpochapu mu na nwam nwoke n'otù n'ihe-nketa Chineke. 17 Nwayi nējere gi ozi we si, Biko, ka okwu onye-nwem, bú eze, diri izu-ike: n'ihi na dika mọ-ozi nke Chineke, otú a ka onye-nwem, bú eze, di inu ezi ihe na ihe ọjọ: Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi. 18 Eze we za, si nwayi ahu, Biko, ezonarilam okwu nke mu onwem nāju gi. Nwayi ahu we si, Biko, ka onye-nwem, bú eze, kwue. 19 Eze we si, Àka Joab diyere gi n'ihe a nile? Nwayi ahu we za, si, Ndu nke nkpuru-obi-gi, onye-nwem, bú eze, ọ dighi onye ọ bula nēsi n'ihe ọ bula onye nwem, bú eze, kwuru, che iru n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe: n'ihi na orù-gi, bú Joab, ya onwe-ya nyerem iwu, ya onwe-ya tiye-kwa-ra okwu ndia nile n'ọnu nwayi nējere gi ozi: 20 ọ bu ichighari iru okwu a ka Joab, bú orù-gi meworo ihe a: ma onye-nwem bu onye mara ihe, dika amam-ihe nke mọ-ozi nke Chineke, ima ihe nile di n'uwa. 21 Eze we si Joab, Biko, le emewom ihe a: gi je kwa, me ka nwa-okorọbia ahu, bú Absalom, lata. 22 Joab we da kpue iru-ya n'ala, kpọ isi ala, gọzie eze: Joab we si, Ta ka orù-gi mara na ahutawom amara n'iru-gi, onye-nwem, bú eze, ebe eze meworo okwu orù-ya. 23 Joab we bilie je Geshua, me ka Absalom bia ba na Jerusalem. 24 Eze we si, Ka o chigharia la n'ulo-ya, ma ọ gaghi-ahu irum anya. Absalom we chigharia la n'ulo-ya, ma ọ hughi iru eze. 25 Ma n'Israel nile ọ dighi nwoke mara nma dika Absalom anētò nke-uku: site n'ọbu-ukwu-ya we rue opu-n'isi-ya ọlu adighi n'aru-ya. 26 Ma mb͕e ọ kọpuru isi-ya, (n'ihi na ọ bu n'ogwugwu arọ n'ọgwugwu arọ ka ọ nākọpu ya: n'ihi na agiri-isi di arọ́ n'isi-ya, o we kọpu ya: ) o we tua agiri-isi di n'isi-ya ọgu shekel iri, n'ihe-ọtùtù eze. 27 Ewe muara Absalom umu-ndikom atọ, na otù nwa-nwayi, aha-ya bu Tema: onye ahu bu nwayi mara nma ile anya. 28 Absalom we biri na Jerusalem arọ abua zuru ezu; ma ọ hughi iru eze. 29 Absalom we zigara Joab ozi, iziga ya jekuru eze; ma o kweghi ibiakute ya: O we ziga ọzọ nke ub͕ò abua, ma ọ kweghi ibia. 30 O we si ndi-orù-ya, Lenu, òkè ala-ubi Joab di n'akuku alam, o nwe-kwa-ra ọka barley n'ebe ahu: jenu, sue ya ọku. Ndi-orù Absalom we sue òkè ala-ubi ahu ọku. 31 Joab we bilie, biakute Absalom rue ulo-ya, si ya, N'ìhi gini ka ndi-orù-gi suworo òkè ala-ubim ọku? 32 Absalom we si Joab, Le, eziterem i ozi, si, Bia n'ebe a, ka m'ziga kwa gi jekuru eze, si N'ìhi gini ka m'siworo na Geshua bia? ọ gādim nma ma asi na mu onwem anọdu n'ebe ahu rue ub͕u a: ma ub͕u a ka m'hu iru eze; ọ buru kwa na ajọ omume adi nimem, ya me ka m'nwua. 33 Joab we biakute eze, gosi ya: o we kpọ Absalom, o we biakute eze, kpọ isi ala nye ya, kpuchie iru-ya n'ala n'iru eze: eze we sutu Absalom ọnu.

2 Samuel 15

1 O rue, mb͕e nka gasiri, na Absalom doziri onwe-ya ub͕ọ-ala na inyinya, na ọgu ndikom abua na iri ndi nāb͕a ọsọ n'iru ya. 2 Absalom we bilie n'isi-ututu, guzo n'akuku uzọ ọnu-uzọ-ama: o rue, mb͕e nwoke ọ bula nwere okwu nke gēru eze nti ka o we kpe ya, na Absalon kpọro ya, si, Òle obodo gi onwe-gi si bia? Ọ si, Otú nime ebo Israel ka orù-gi si bia. 3 Absalom we si ya, Le, okwu-gi nile di nma, zi kwa ezi; ma ọ dighi onye nēge gi nti site n'ebe eze nọ. 4 Absalom we si, Ònye gēdom onye-ikpe n'ala nka, ka nwoke ọ bula nke nwere okwu ma-ọbu ikpé we biakutem, m'we kpọ ya onye ezi omume! 5 O rue, mb͕e nwoke ọ bula biaruru ya nso ikpọ isi ala nye ya, na o setiri aka-ya, jide ya, sututu ya ọnu. 6 Absalom we mere Israel nile dika okwu a si di, bú ndi biakutere eze ka ekpe ha ikpe: Absalom we zuru obi ndikom Israel n'ori. 7 O rue, n'ọgwugwu ọgu arọ abua, na Absalom siri eze, Biko, ka m'je kwughachi nkwam, nke, m'kwere Jehova, nime Hebron. 8 N'ihi na orù-gi kwere nkwa mb͕e m'biri na Geshua nime Siria, si, Ọ buru na Jehova eme ka m'laghachi na Jerusalem n'ezie, m'gēfè kwa Jehova òfùfè. 9 Eze we si ya, Je n'udo. O we bilie, jerue Hebron. 10 Absalom we ziga ndi-nledo n'ebo nile nke Israel, si, Mb͕e unu nuru olu opì-ike, unu gāsi kwa, Absalom bu eze na Hebron. 11 Ọgu ndikom iri we si na Jerusalem soro Absalom je, bú ndi akpọrọ, ha we nēje n'izu-okè obi-ha; ma ha amaghi ihe ọ bula. 12 Absalom we zipu Ahitofel onye Gailo, bú onye nādu Devid ọdu, n'obodo-ya, bú Gailo mb͕e ọ nāchu àjà. Nkekọta ahu we di ike; ndi Israel nāba kwa uba nēje n'iru n'iru n'aka Absalom. 13 Onye nēgosi ihe we biakute Devid, si, Obi ndikom Israel di iso Absalom n'azu. 14 Devid we si ndi-orù-ya nile, ndi ya na ha nọ na Jerusalem, Bilienu, ka ayi b͕apu; n'ihi na ayi enweghi nb͕apu n'iru Absalom: menu ngwa ije, ka o we ghara ime ngwa rue ayi aru, me ka ihe ọjọ kwagide ayi, were ọnu mma-agha tib͕ue obodo a. 15 Ndi-orù eze we si eze, Dika ihe nile si di nke onye-nwem, bú eze, garọputa, le, ndi-orù-gi. 16 Eze we pua, ya na ulo-ya nile ndi soro ya n'ukwu n'ukwu. Eze we rapu ndinyom iri, bú ndi-iko-ya nwayi, iche ulo. 17 Eze we pua, ya na ndi-ya nile ndi soro ya n'ukwu n'ukwu; ha we nọdu na Bet-meahak. 18 Ndi-orù-ya nile we nāgabiga n'akuku ya; ndi Keret nile, na ndi Pelet nile, na ndi Gat nile, bú nnù ndikom na ọgu iri ndi siri na Gat bia, soro ya n'ukwu n'ukwu, nāgabiga kwa n'iru eze. 19 Eze we si Itai, bú onye Gat, N'ìhi gini ka gi onwe-gi nēso kwa ayi je? laghachi, soro eze nọdu: n'ihi na onye ala ọzọ ka i bu, onye rapuru ala-ya ka i bu kwa; laghachi n'ebe-gi. 20 nyahuru bu ọbibia-gi, ọ̀ bu ta ka m'gēme gi ka i ṅagharia n'iso ayi je, n'ihi na mu onwem nēje ebe mu onwem nēje? gi laghachi, me kwa ka umu-nne-gi laghachi; ka ebere na ezi-okwu diyere gi. 21 Itai we za eze, si, Jehova nādi ndu, onye-nwem, bú eze, nādi kwa ndu, n'ezie n'ọnọdu ebe onye-nwem, bú eze, gānọ, ma-ọbu inwu ọnwu ma-ọbu idi ndu, n'ezie n'ebe ahu ka orù-gi gānọ kwa. 22 Devid we si Itai, Je gabiga. Itai onye Gat we gabiga, ya na ndikom-ya nile, na umu-ntakiri nile nke di n'aka-ya. 23 Ala ahu nile nākwa ákwá n'oké olu, ndi ahu nile nāgabiga kwa: eze nāgabiga kwa miri-iyi Kidron, ndi-ya nile nāgabiga kwa, n'iru uzọ ọzara. 24 Ma, le, Zedok bia-kwa-ra, ya na ndi Livai nile, nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Chineke; ha we dọba ib͕e Chineke, Abaiata we rigo, rue mb͕e ndi ahu nile siri n'obodo gabigasia. 25 Eze we si Zedok Bughachi ib͕e Chineke n'obodo; o buru na ahutam amara n'iru Jehova, Ọ gēweghachim, me ka m'hu ya na ebe-obibi-Ya: 26 ma ọ buru na Ọ si otú a, Ihe-gi atọghm utọ; lem, Ya mem otú ọ di nma n'anya-Ya. 27 Eze we si Zedok, bú onye-nchu-àjà, Ọ̀ bughi onye-ọhu-uzọ ka i bu? laghachi n'obodo n'udo, unu na Ahimaaz nwa-gi, na Jonatan nwa Abaiata, bú umu-unu abua. 28 Lenu, mu onwem ganānọgide na ngabiga-miri nke ọzara, rue mb͕e okwu gēsi n'ebe unu nọ bia igosim ka ihe si di. 29 Zedok na Abaiata we bughachi ib͕e Chineke na Jerusalem: ha we nọdu n'ebe ahu. 30 Ma Devid nārigo na nrigo ugwu Olive, nārigo nākwa ákwá; ekpuchi-kwa-ra isi-ya, ya onwe-ya nēje kwa b͕ara ukwu efu: ndi nile ndi soro ya je kpuchi-kwa-ra, nwoke ọ bula isi-ya, ha we rigo, nārigo nākwa ákwá. 31 Otú onye we gosi Devid, si, Ahitofel di n'etiti ndi-nkekọta ahu ndi nēso Absalom. Devid we si, Biko, Jehova, me ka idu-ọdu Ahitofel ghọ ihe-nzuzu. 32 O rue, na mb͕e Devid biaruru elu nrigo ahu, ebe ọ nākpọ isi ala nye Jehova, le, Hushai, bú onye-Akait, biara izute ya, ya na uwe-ya adọwara adọwa, na ájá n'elu isi-ya. 33 Devid we si ya, Ọ buru na i sorom gabiga, i gābu-kwa-ram ibu: 34 ma ọ buru na i laghachi n'obodo, we si Absalom, Orù-gi ka m'bu, eze; dika mu onwem bu orù nna-gi na mb͕e gara aga, ub͕u a mu onwem gābu kwa orù-gi: i gēmebi-kwa-ram idu-ọdu Ahitofel. 35 Gi na ha anọghi kwa n'ebe ahu, bú Zedok na Abaiata ndi-nchu-àjà? o gēru kwa, na okwu ọ bula i gānu site n'ulo eze, i gēgosi ya Zedok na Abaiata, bú ndi-nchu-àjà. 36 Le, ha na umu-ha ndikom abua nọ n'ebe ahu, bú Ahimaaz nwa Zedok, na Jonatan nwa Abaiata; site n'aka-ha ka unu gēzite-kwa-ram okwu ọ bula unu gānu. 37 Hushai, bú eyi Devid, we ba n'obodo; Absalom ba-kwa-ra nime Jerusalem.

2 Samuel 16

1 Devid we gabiga elu nrigo nke-ntà, ma, le, Ziba, onye nējere Mefiboshet ozi, zutere ya, chiri inyinya-ibu abua ejikwara ejikwa, ọgu ob͕e achicha iri di kwa n'elu ha, na ọgu uyọkọ nkpuru-vine amiri ami ise, na ọgu nkpuru mb͕e okpom-ọku ise, na otù karama-akpukpọ manya-vine. 2 Eze we si Ziba, Gina ka i gēji ihe ndia me? Ziba we si, Inyinya-ibu ndia bu ka ndi ulo eze we nọkwasi ha; achicha na nkpuru mb͕e okpom-ọku bu ka umu-okorọbia we rie ha; manya-vine bu ka ndi nāda mbà nọzara we ṅua. 3 Eze we si, Ma òle ebe nwa onye-nwe-gi nọ? Ziba we si eze, Le, ọ nānọ na Jerusalem: n'ihi na ọ siri, Ta ka ulo Israel gēnyeghachim ala-eze nnam. 4 Eze we si Ziba, Le, gi gēnwe ihe nile Mefiboshet nwere. Ziba we si, Anamakpọ isi ala; ka m'huta amara n'iru gi, onye-nwem, bú eze. 5 Eze, bú Devid, we biarute Bahurim, ma, le, otú nwoke nke sitere n'ab͕uru ulo Sọl nēsi n'ebe ahu puta, aha-ya bu Shimai, nwa Gira: ọ nāputa, nākọcha ka ọ nāputa. 6 Ọ tua Devid nkume, tu kwa ndi-orù nile nke eze, bú Devid: ndi Israel nile na ndi-dike nile di kwa n'aka-nri-ya na n'aka-ekpe-ya. 7 Ma otú a ka Shimai siri mb͕e ọ nākọcha, Pua, pua, gi nwoke ọbara na nwoke jọb͕uru onwe-ya: 8 Jehova eweghachiwo n'isi-gi ọbara nile nke ulo Sọl, onye i buworo eze n'ọnọdu ya; Jehova enyewo kwa ala-eze n'aka Absalom, bú nwa-gi: ma, le, n'ihe ọjọ gi ka ejideworo gi, n'ihi na nwoke ọbara ka i bu. 9 Abishai nwa Zeruaia we si eze, N'ìhi gini ka nkita nka nke nwuru anwu nākọcha onye-nwem, bú eze? biko, ka m'gabiga, wezuga isi-ya. 10 Eze we si, Gini ka mu na unu nwekọrọ umu Zeruaia? mb͕e ọ nākọcha, mb͕e Jehova siwo-kwa-ra ya, Kọcha Devid; ònye gāsi kwa, Gini mere i meworo otú a? 11 Devid we si Abishai, si kwa ndi-orù-ya nile, Le nwam, nke siri n'afọm puta, nāchọ ndum: onye Benjamin nka, ò gēsi kwa aṅa ghara ichọkari ya ub͕u a? ka ọ nọduru onwe-ya, ka ọ kọcha kwa; n'ihi na Jehova siworo ya, Kọcha. 12 Eleghi anya Jehova gēlekwasi nwedam anya, Jehova gēnyeghachikwam ezi ihe n'ọnọnọdu nkọcha-ya ta. 13 Devid na ndikom-ya we je n'uzọ ahu: Shimai nēje kwa n'akuku ugwu na ncherita-iru ya, ọ nēje ije we kọcha, tu kwa nkume na ncherita-iru ya, kpoli kwa ájá. 14 Eze na ndi nile ndi ya na ha yikọrọ je, we biarue Ayefim; o we turu ndu n'ebe ahu. 15 Absalom na ndi nile, bú ndikom Israel, we ba na Jerusalem, Ahitofel so-kwa-ra ya ba. 16 O rue, mb͕e Hushai, bú onye-Akait, bú eyì Devid, biakutere Absalom, na Hushai siri Absalom, Ka eze di ndu, ka eze di ndu. 17 Absalom we si Hushai, Ọ̀ bu nka bu ebere i nēmere eyi-gi? n'ìhi gini ka i nēsoghi eyì-gi je? 18 Hushai we si Absalom, É-è, kama onye Jehova na ndi nka na ndikom nile nke Israel rọputaworo, ya ka m'gādiri, ọ bu kwa n'aka-ya ka m'gēbiri. 19 Ọzọ kwa, ònye ka mu onwem gēfè òfùfè? Ọ̀ bughi n'iru nwa-ya? dika m'fèworo òfùfè n'iru nna-gi, otú a ka m'gābu n'iru gi. 20 Absalom we si Ahitofel, Duanu ọdu n'onwe-unu ihe ayi gēme. 21 Ahitofel we si Absalom, Bakuru ndi-iko nna-gi ndinyom, ndi o mere ka ha nọdu iche ulo; Israel nile gānu kwa na i nēsi nna-gi ísì ọjọ: aka ndi nile gi na ha nọ gādi kwa ike. 22 Ha we b͕asara Absalom ulo-ikwū n'elu ulo; Absalom we bakuru ndi-iko nna-ya ndinyom n'anya Israel nile. 23 Ọdu Ahitofel, nke ọ duru na mb͕e ahu, di ka agāsi na ajuru ase n'okwu Chineke: otú a ka idu-ọdu nile nke Ahitofel di, ma n'ebe Devid nọ ma n'ebe Absalom nọ.

2 Samuel 17

1 Ahitofel we si Absalom, Biko, ka m'rọputa orú nnù ndikom na nnù iri, bilie, chua Devid n'azu n'abali a: 2 m'gābiakwasi kwa ya mb͕e ike gwuru ya onwe-ya, na mb͕e aka-ya nādighi ike, m'gēme kwa ka ọ ma jijiji: ndi nile ndi ya na ha nọ gāb͕alaga kwa; m'gētib͕u kwa eze, nání ya: 3 m'gēme kwa ka ndi-ya nile laghachikute gi: dika nlaghachi madu nile ka nwoke ahu bu, onye gi onwe-gi nāchọ: ndi Israel nile gānọ n'udi. 4 Okwu ahu ziri ezi n'anya Absalom na n'anya ndi-okenye nile nke Israel. 5 Absalom we si, Biko, kpọ kwa Hushai, bú onye-Akait, ka ayi nuru kwa ihe di kwa n'ọnu ya onwe-ya. 6 Hushai we biakute Absalom, Absalom we gwa ya okwu, si, Dika okwu a si di ka Ahitofel kwuru: àyi gēme ihe o kwuru? ọ buru na ayi agaghi-eme ya, gi onwe-gi kwue. 7 Hushai we si Absalom, Ọdu nke Ahitofel duworo ub͕u a adighi nma. 8 Hushai we si, Gi onwe-gi amawo nna-gi na ndikom-ya, na ndi-dike ka ha bu, ndi nkpuru-obi-ha di ilu ka ha bu kwa, dika bear ab͕abara aka nwa n'ọhia: nna-gi bu kwa nwoke agha, ọ gaghi-esoro kwa ndi-ya nọ ọnọdu abali. 9 Le, ub͕u ya onwe-ya ezowo onwe-ya n'otù olùlù ma-ọbu n'otù nime ọnọdu-ya: o gēru kwa, mb͕e ufọdu nime ha dara na nmalite, na onye ọ bula nānu ya gāsi, Ntib͕u di n'etiti ndi ahu nke nēso Absalom. 10 Onye ahu kwa, ọbuná onye bu dìnkpà, onye obi-ya di ka obi ọdum, ọ gāb͕aze ab͕aze: n'ihi na Israel nile amawo na dike ka nna-gi bu, ndi bu dìnkpà ka ha bu kwa, bú ndi ya na ha nọ. 11 Ma anamadu ọdu ka achikọtasia Israel nile n'ebe i nọ site na Dan we rue Bia-sheba, dika ájá nke di n'akuku oké osimiri n'iba-uba: ka iru-gi nēje kwa n'agha ahu. 12 Ayi gābiakute kwa ya n'otù nime ọnọdu ebe agāchọta ya, ayi onwe-ayi gādakwasi kwa ya dika igirigi nādakwasi n'ala: ayi agaghi-eme kwa ka ọbuná otù onye fọdu n'etiti ya na n'etiti ndikom nile ndi ya na ha nọ. 13 Ma ọ buru na achikọta ya n'otù obodo, agēme kwa ka Israel nile chita udọ̀ n'obodo ahu, ayi gādọ kwa ya rue miri-iyi, rue mb͕e agaghi-ahuta ọbuná otù ajirija nkume n'ebe ahu. 14 Absalom na ndikom nile nke Israel we si, Idu-ọdu Hushai, bú onye-Akait, di nma kari idu-ọdu Ahitofel, Ma Jehova nyere iwu imebi ezi idu-ọdu nke Ahitofel, ka Jehova we me ka ihe ọjọ biakwasi Absalom. 15 Hushai we si Zedok na Abaiata, bú ndi-nchu-àjà, Otú a na otú a ka Ahitofel duru Absalom na ndi-okenye Israel ọdu; otú a na otú a ka mu onwem du-kwa-ra. 16 Ma ub͕u a ziganu ngwa ngwa, gosi Devid, si, Anọla ọnọdu abali a n'ala ihe nādighi nke ọzara, kama i ghaghi igabiga; ka aghara iloda eze na ndi nile ndi ya na ha nọ. 17 Ma Jonatan na Ahimaaz nēguzo n'En-rogel; nwayi nēje ozi we je gosi ha; ndi ahu we je gosi eze, bú Devid: n'ihi na ọ gaghi-ekwe me, bú ka ahú ka ha ba n'obodo. 18 Otù nwa-okoro we hu ha, gosi, Absalom: ha abua we je ngwa ngwa, ba n'ulo otù nwoke nime Bahurim, onye nwere olùlù-miri n'ogige-ya; ha we rida n'ebe ahu. 19 Nwayi nwe-ulo we were ihe-nkpuchi-ya b͕asa ya n'ọnu olùlù-miri ahu, tusa ọka asuru asu n'elu ya; ma ọ dighi ihe amara. 20 Ndi-orù Absalom we biakute nwayi ahu n'ulo, si, Òle ebe Ahimaaz na Jonatan nọ? Nwayi ahu we si ha, Ha agabigawo iyi miri. Ha we chọ, ma ha achọtaghi ha, ha we lata na Jerusalem. 21 O rue, mb͕e ha lasiri, na ha siri n'olùlù-miri ahu rigota, je, gosi eze, bú Devid; ha we si Devid, Bilienu, gabiga miri ngwa ngwa; n'ihi na otú a ka Ahitofel duworo ọdu megide unu. 22 Devid we bilie, ya na ndi nile ndi ya na ha nọ, ha we gabiga Jọdan; mb͕e ìhè ututu putara ọ dighi onye fọduru nke nāgabigaghi Jọdan. 23 Ma Ahitofel huru na emeghi ihe ọ duru n'ọdu, o we jikwa inyinya-ibu-ya, bilie, la n'ulo-ya, rue obodo-ya, o we nye ulo-ya iwu, kwub͕u onwe-ya: o we nwua, elíe ya n'ílì nna-ya. 24 Ma Devid biaruru Mahanaim. Absalom we gabiga Jọdan, ya onwe-ya na ndikom nile nke Israel tiyere ya. 25 Ma Amasa ka Absalom doro onye-isi usu-ndi-agha n'ọnọdu Joab. Ma Amasa bu nwa otù nwoke, aha-ya bu Itra onye Israel, onye bakuru Abigal nwa-nwayi Nehash, nwa-nne-nwayi nke Zeruaia nne Joab. 26 Israel na Absalom we ma ulo-ikwū-ha n'ala Gilead. 27 O rue, mb͕e Devid biaruru Mahanaim, na Shobi nwa Nehash nke Raba umu Amon, na Makia nwa Amiel nke Lo-deba, na Bazilai onye Gilead nke Rogelim, 28 wetara nso Devid, weta kwa nso ndi ya na ha nọ, ihe-ndina, na ọkwa, na ite nke ọkpu-ite kpuru, na ọka wheat, na ọka barley, na utu ọka, na ọka aṅara aṅa, na akidi, na lentil, na ọka aṅara n'oko, 29 na manu-aṅu, na miri-ara-ehi nke raru araru, na ìgwè ewu na aturu, na cheese nke ìgwè ehi, ka ha rie: n'ihi na ha siri, Agu nāgu ndi nka, ha nāda kwa mbà, akpiri nākpọ kwa ha nku, n'ọzara.

2 Samuel 18

1 Devid we gukọta ndi ya na ha nọ, do ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri na ndi-isi usu ọgu ndikom ise ichi ha. 2 Devid we zipu ndi ahu, otù uzọ n'uzọ atọ n'aka Joab, na otù uzọ n'uzọ atọ n'aka Abishai nwa Zeruaia, nwa-nne Joab, na otù uzọ n'uzọ atọ n'aka Itai, bú onye Gat Eze we si ndi-ya, Aghaghm iso unu pua, ọbuná mu onwem. 3 Ndi-ya we si, I gaghāpu: n'ihi na ọ buru na ayi ab͕alaga ab͕alaga, ha agaghi-atukwasi ayi obi: ọ buru kwa na nkera nime ayi anwua, ha agaghi-atukwasi ayi obi: n'ihi na ub͕u a orú nnù ndikom na nnù ise dika ayi di; ma ub͕u a ọ di nma ka i buru ayi onye-iye-aka site n'obodo. 4 Eze we si ha, Ihe di nma n'anya-unu ka m'gēme. Eze we guzo n'akuku ọnu-uzọ-ama, ndi-ya nile we nāpu n'ọgu ise ọgu ise, na nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri. 5 Eze we nye Joab na Abishai na Itai iwu, si, Menu nwayọ n'aru nwa-okorọbia, bú Absalom, n'ihim. Ndi-ya nile nu-kwa-ra mb͕e eze nyere ndi-isi nile iwu bayere Absalom. 6 Ndi-ya we pua je n'ọhia izute Israel: agha ahu we di n'oké ohia Efraim. 7 Ewe tib͕ue ndi Israel n'ebe ahu n'iru ndi-orù Devid, ntib͕u uku we di n'ebe ahu n'ubọchi ahu, bú orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri. 8 Ewe nāb͕asa agha ahu n'ebe ahu n'elu ala ahu nile; oké ọhia ahu we ripia ọtutu madu n'etiti ndi Israel n'ubọchi ahu kari ndi mma-agha ripiara. 9 Absalom we zute ndi-orù Devid. Ma Absalom nānọkwasi n'inyinya mule-ya, inyinya mule ahu we ba n'okpuru alaka tuhiri atuhi nke oké osisi terebinth, isi-ya we kogide n'osisi terebinth ahu, ewe do ya n'etiti elu-igwe na ala; ma inyinya mule ahu nke di n'okpuru ya gabigara. 10 Otù nwoke we hu ya, gosi Joab, si, Le, ahurum Absalom ka ọ kwuru n'osisi terebinth. 11 Joab we si nwoke ahu nke nēgosi ya, Ma, le, i huru ya, ma gini mere i tib͕ughi ya n'ebe ahu rue ala? ọ gābu kwa ọlum inye gi ọla-ọcha iri, na otù ihe-ọkiké. 12 Nwoke ahu we si Joab, Ọ buru kwa na mu onwem ejide n'ọbu-akam nnù ọla-ọcha abua na ọgu iri, ma m'gaghi-eseti akam imegide nwa eze: n'ihi na ọ bu na nti-ayi ka eze nyere gi na Abishai na Itai iwu, si, Lezienu anya bayere nwa-okorọbia ahu, bú Absalom, onye ọ bula. 13 Ma asi na emem otú a, m'gēme ihe-ugha megide ndum, (ma ọ dighi okwu ọ bula agēzonari eze, ) gi onwe-gi gēguzo kwa onwe-gi n'akuku ọzọ. 14 Joab we si, Ọ bughi otú a ka m'ganēche n'iru gi. O we chiri nkpa-n'aka atọ n'aka-ya, dubà ha n'obi Absalom, mb͕e ọ nānọ na ndu n'etiti osisi terebinth. 15 Umu-okorọbiua iri ndi nēbu ihe-agha Joab we b͕a gburugburu, tib͕ue Absalom, me ka o nwua. 16 Joab we fùa opì-ike, ndi Devid we si n'ichu Israel n'azu lata: n'ihi na Joab b͕ochiri ndi ahu. 17 Ha we were Absalom, tubà ya n'olùlù uku n'oké ọhia ahu, me ka oké obo uku nke nkume guzo n'elu ya: Israel nile we b͕alaga, onye ọ bula n'ulo-ikwū-ya 18 Ma Absalom, mb͕e ọ nọ na ndu, o were ogidi nke di na ndagwurugwu eze guzoro onwe-ya: n'ihi na ọ siri, Enweghm nwa-nwoke ime ka echeta aham: o we kpọ ogidi ahu n'aha-ya: ewe kpọ ya ihe-ncheta Absalom, rue ta. 19 Ahimaaz nwa Zedok we si, Biko, ka m'b͕a ọsọ zìe eze ozi ọma, na Jehova ekpeputawo ya n'aka ndi-iro-ya. 20 Joab we si ya, Ọ bughi onye ozi ọma ka i gābu ta, kama i gēzi ozi ọma ubọchi ọzọ: ma ta i gaghi-ezí ozi ọma, n'ihi na nwa eze anwuwo. 21 Joab we si onye Kush, Je gosi eze ihe i huworo. Onye Kush ahu we kpọ isi ala nye Joab, b͕a ọsọ. 22 Ahimaaz nwa Zedok we si kwa Joab ọzọ, Ma otú ọ di, biko, ka m'b͕a ọsọ, mu onwem kwa, n'azu onye Kush. Joab we si, N'ìhi gini kwa ka gi onwe-gi ganāb͕a ọsọ, nwam, ma ọ dighi ozi ọma ahutara gi. 23 Ma otú ọ di, m'gāb͕a ọsọ, ka o kwuru. Ọ si ya, B͕a ọsọ. Ahimaaz we b͕a ọsọ Buruburu-ala, b͕abiga onye Kush ahu. 24 Ma Devid nānọdu n'etiti ọnu-uzọ-ama abua ahu: onye-nche we jerue elu-ulo ọnu-uzọ-ama rue mbidi obodo, we welie anya-ya, hu, ma, le, otù nwoke nāb͕a ọsọ nání ya. 25 Onye-nche we kpọ òkù, gosi eze. Eze we si, Ọ buru na ọ bu nání ya, ozi ọma di n'ọnu-ya. O we bia si-ike, biarue nso. 26 Onye-nche we hu nwoke ọzọ ka ọ nāb͕a ọsọ: onye-nche we kpọ onye nēche ọnu-uzọ òkù, si, le, nwoke ọzọ nāb͕a ọsọ, nání ya. Eze we si, Onye ahu nēzi kwa ozi ọma. 27 Onye-nche we si, Mu onwem nāhu ọb͕ub͕a-ọsọ nke onye mbu, ọ di ka ọb͕ub͕a-ọsọ Ahimaaz nwa Zedok. Eze we si, Ezi nwoke ka onye ahu bu, ọ bu kwa ezi ozi ọma ka ọ nābia izì. 28 Ahimaaz we kpọ òkù, si eze, Udo. Ọ kpọ isi ala nye eze, kpuchie iru-ya n'ala, si, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke-gi, bu, Onye mechibidoworo ndikom ahu ndi weliri aka-ha imegide onye-nwem, bú eze. 29 Eze we si, Ùdo diri nwa-okorọbia ahu, bú Absalom: Ahimaaz we si, Ahurum oké ìgwè madu mb͕e Joab zitere orú eze na orù-gi, ma amaghm ihe ọ bu. 30 Eze we si, Chigharia, guzo onwe-gi n'ebe a. O we chigharia, guzo. 31 Ma, le, onye Kush biara; onye Kush we si, Ka ezìe onye-nwem, bú eze, ozi ọma: n'ihi na Jehova ekpeputawo gi ta n'aka ndi nile nēbili imegide gi. 32 Eze we si onye Kush ahu, Ùdo diri nwa-okorọbia ahu, bú Absalom? Onye Kush we si, Ndi-iro onye-nwem, bú eze, na ndi nile ndi biliworo megide gi imejọ gi, ka ha di ka nwa-okorọbia ahu. 33 Eze we ma jijiji nke-uku, rigo rue ulo-elu nke ọnu-uzọ-ama, kwa ákwá: ma otú a ka o siri mb͕e ọ nēje, Nwam Absalom, nwam, nwam Absalom! ọ gādim nọ̄ nma ma asi na mu onwem anwuwo n'ọnọdu gi, Absalom, nwam, nwam!

2 Samuel 19

1 Ewe gosi Joab, si, Le, eze nākwa ákwá, nēru-kwa-ra Absalom újú. 2 Nzọputa we ghọrọ ndi Devid nile iru-újú n'ubọchi ahu: n'ihi na ndi Devid nuru n'ubọchi ahu, si, Ọ nēwuta eze n'ihi nwa-ya. 3 Ndi Devid we ghèré bà n'obodo n'ubọchi ahu, dika ndi ihere nēme nēghepu mb͕e ha nāb͕alaga n'agha. 4 Ma eze kpuchiri iru-ya, eze we tie nkpu n'oké olu, si, Nwam Absalom, Absalom, nwam, nwam! 5 Joab we bakuru eze n'ulo, si, I mewo ka ihere me iru ndi-orú-gi nile ta, bú ndi nēwepuga ndu-gi, na ndu umu-gi ndikom na nke umu-gi ndinyom, na ndu ndinyom-i, na ndu ndi-iko-gi nwayi, ta; 6 n'ihu ndi nākpọ gi asi n'anya, na n'ikpọ ndi nāhu gi n'anya asi. N'ihi na i gosiwo ta, na ndi-isi na ndi-orù abughi ihe n'anya-gi: n'ihi na amawom, ta, na asi na Absalom adiwo ndu, asi kwa na ayi nile anwuwo ta, mb͕e ahu o gēzi ezi n'anya-gi. 7 Ma ub͕u a bilie, pua, gwa ndi-orù-gi okwu gāba ha n'obi: n'ihi na aṅuwom iyi na Jehova, na ọ dighi otù nwoke gēsoro gi nọ ọnọdu abali a, ma asi na i gaghi-apu: ma nke ahu gājọrọ gi njọ kari ihe ọjọ nile nke biakwasiworo gi site ka i di na nwata rue ub͕u a. 8 Eze we bilie, nọdu n'ọnu-uzọ-ama. Ha we gosi ndi ya nile, si, Le, eze nānọdu n'ọnu-uzọ-ama: ndi ahu nile we bia n'iru eze. Ma Israel b͕alagara, nwoke o bula n'ulo-ikwū-ya. 9 Ndi Israel nile we nēse okwu n'ebo nile nke Israel, si, Eze naputara ayi n'ọbu-aka ndi-iro-ayi, ya onwe-ya me kwa-ra ka ayi wepuga onwe-ayi n'ọbu-aka ndi Filistia; ma ub͕u a o siwo n'ala b͕alaga n'ihi Absalom. 10 Ma Absalom, onye ayi tere manu ibu isi-ayi, anwuwo n'agha. Ma ub͕u a n'ihi gini ka unu onwe-unu nādighi-ekwu ime ka eze lata? 11 Eze, bú Devid, we zigara Zedok na Abaiata, bú ndi-nchu-àjà, ozi, si, Gwanu ndi-okenye Juda okwu, si, N'ìhi gini ka unu bu ndi-ikpe-azu ime ka eze lata n'ulo-ya? ma okwu Israel nile abiaruwo eze nti, ime ka ọ lata n'ulo-ya? 12 Umu-nnem ka unu bu, ọkpukpum na anu-arum ka unu bu: n'ìhi gini kwa ka unu bu ndi-ikpe-azu ime ka eze lata? 13 Amasa ka unu gāsi kwa, Ọ̀ bughi ọkpukpum na anu-arum ka i bu? Chineke mem otú a, mekwam ihe ọzọ otú a, ma ọ buru na i ghọghi onye-isi usu-ndi-agha n'irum ubọchi nile n'ọnọdu Joab. 14 O we me ka obi ndikom nile nke Juda rulata, dika otù nwoke; ha we zigara eze ozi, si, Lata, gi onwe-gi na ndi-orù-gi nile. 15 Eze we lata, bia rue Jọdan. Juda we biarue Gilgal, ije izute eze, ime ka eze gabiga Jọdan. 16 Shimai nwa Gira, bú onye Benjamin, nke sitere na Bahurim, we me ngwa soro ndikom Juda ridata izute eze, bú Devid. 17 Nnù ndikom abua na ọgu iri so-kwa-ra ya site na Benjamin; Ziba kwa, onye nējere ulo Sọl ozi, ya na umu-ya ndikom iri na ise na orú ndi-orú-ya; ha we jisie ike gabiga Jọdan n'iru eze. 18 Ma ub͕o-nwebiga gabigara iwebiga ndi ulo eze, na ime ihe di nma n'anya-ya. Shimai nwa Gira we da n'iru eze, mb͕e ọ gabigara Jọdan. 19 Ọ si eze, Ka onye-nwem ghara igu ajọ omume nyem, echeta-kwa-la ihe orù-gi mere n'ajọ omume n'ubọchi onye-nwem, bú eze, siri na Jerusalem pua, ka eze we tiye ya n'obi-ya. 20 N'ihi na orù-gi amawo na mu onwem emehiewo: ma, le, abiawom ta, buru ulo nile nke Josef uzọ irida izute onye-nwem, bú eze. 21 Abishai nwa Zeruaia we za, si, Àgaghi-eme ka Shimai nwua n'ihi nka, n'ihi na ọ kọchara onye Jehova etere manu? 22 Devid we si, Gini ka mu na unu nwekọrọ, umu-ndikom Zeruaia, na unu gāburum onye-nmegide ta? àgēme ka nwoke ọ bula nwua n'Israel ta? n'ihi na ọ̀ bu na amaghm na ta ka mu onwem bu eze Israel? 23 Eze we si Shimai, I gaghi-anwu. Eze we ṅuara ya iyi. 24 Mefiboshet nwa Sọl rida-kwa-ra izute eze; ma o dozighi ukwu-ya, o dozighi kwa afu-ọnu-ya, ọ sughi kwa uwe-ya miri, site n'ubọchi eze jere rue ubọchi mb͕e ọ bia-kwa-ra n'udo. 25 O rue, mb͕e ọ biaruru Jerusalem izute eze, na eze siri ya, N'ìhi gini ka i nēsoghm je, Mefiboshet? 26 Ọ si, Onye-nwem, eze, orùm ghọb͕urum: n'ihi na orù-gi siri, Ka m'jikwara onwem inyinya-ibu, ka m'we nọkwasi ya, soro eze je; n'ihi na orù-gi dara ngwurọ. 27 O we kwulu orù-gi n'ebe onye-nwem, bú eze, nọ; ma onye-nwem, bú eze, di ka onye-ozi Chineke: gi me kwa ihe di nma n'anya-gi. 28 N'ihi na ulo nnam nile abughi ihe ọ bula ma-ọbughi ndi ọnwu n'iru onye-nwem, bú eze: ma i doro orù-gi n'etiti ndi nēri ihe na table nke gi. Ma èzi omume gini ka m'nwere ọzọ itiku eze nkpu ọzọ? 29 Eze we si ya, N'ìhi gini ka i nēkwu okwu bayere okwu-gi nile ọzọ? Asiwom, Gi onwe-gi na Ziba gēkè ubi ahu. 30 Mefiboshet we si eze, E, ya were ihe nile, ebe onye-nwem, bú eze, biaworo n'ulo-ya n'udo. 31 Bazilai, bú onye Gilead, we si na Rogelim rida; o we soro eze gabiga Jọdan, izilaga ya n'ofè Jọdan. 32 Ma Bazilai mere agadi nke-uku, ọ b͕ara ọgu arọ anọ: ya onwe-ya zù-kwa-ra eze mb͕e ọ nānọdu na Mahanaim; n'ihi na oké madu ka ọ bu nke-uku. 33 Eze we si Bazilai, Gi onwe-gi sorom gabiga, m'gāzù kwa gi n'ebe m'nọ na Jerusalem. 34 Bazilai we si eze, Ùbọchi arọ nke ndum di ole, m'gēji soro eze rigorue Jerusalem? 35 Ọgu arọ anọ ka m'b͕ara ta: m'gāmara ihe di iche n'etiti ezi ihe na ihe ọjọ? òrù-gi gāmata utọ ihe m'nēri ma-ọbu nke m'nāṅu? m'gēge nti ọzọ n'olu ndikom nābu abù na ndinyom nābu abù? n'ihi gini kwa ka orù-gi gāburu onye-nwem, bú eze, ibu ọzọ? 36 Dika ihe ntà orù-gi nēso eze gabiga Jọdan: n'ìhi gini kwa ka eze gēnyeghachim ihe-nnyeghachi a? 37 Biko, ka orù-gi laghachi, ka m'we nwua n'obodom, n'akuku ílì nnam na nnem. Ma, le, orù-gi, bú Kimham; ya soro onye-nwem, bú eze, gabiga; gi me-kwa-ra ya ihe di nma n'anya-gi. 38 Eze we si, Kimham gēsom gabiga, mu onwem gēme-kwa-ra ya ihe di nma n'anya-gi: ma ihe ọ bula i gārọputa ka m'mere gi, m'gēmere gi ya. 39 Ndi Devid nile we gabiga Jọdan, eze gabiga-kwa-ra: eze we sutu Bazilai ọnu, gọzie ya: o we laghachi n'ebe-ya. 40 Eze we gabiga rue Gilgal, Kimham so-kwa-ra ya gabiga: ndi nile nke Juda we me ka eze gabiga, ha na nkera ndi Israel. 41 Ma, le, ndikom nile nke Israel nābiakute eze, we si eze, Gini mere umu-nne-ayi, bú ndikom Juda, zupuru gi n'ori, me ka eze na ulo-ya gabiga Jọdan, na ndikom Devid nile tiyere ya? 42 Ndikom nile nke Juda we za ndikom Israel, si, N'ihi eze di ayi nso n'aru: n'ìhi gini kwa ka iwe-unu di ọku bayere ihe a? àyi eriwo ihe si n'aka eze puta ma-ọli? ọ̀ di onyinye-nri ọ bula o wetara ayi? 43 Ndikom Israel we za ndikom Juda, si, Òkè iri ka ayi nwere n'eze, ọzọ kwa, ayi nwere òkè nime Devid kari unu: gini me-kwa-ra unu lelìri ayi anya, ka okwu-ayi ghara ibu uzọ n'ime ka eze-ayi lata? Ma okwu ndikom Juda siri ike kari okwu ndikom Israel.

2 Samuel 20

1 Ma ọ dabatara otù nwoke jọb͕uru onwe-ya inọ n'ebe ahu, aha-ya bu Sheba, nwa Bikri, onye Benjamin: o we fùa opì-ike, si, Ayi enweghi òkè nime Devid, ayi enweghi kwa ihe-nketa nime nwa Jesi: nwoke ọ bula, ya la n'ulo-ikwū-ya, Israel. 2 Ndikom nile nke Israel we si n'iso Devid rigo, so Sheba nwa Bikri: ma ndikom Juda rapara n'aru eze-ha, site na Jọdan we rue Jerusalem. 3 Devid we biarue ulo-ya na Jerusalem; eze we chiri ndinyom iri ahu, bú ndi-iko-ya, ndi o mere ka ha nọdu iche ulo, o we tiye ha n'ulo-ndebe, nāzu ha, ma ọ bakurughi ha. Ha we buru ndi emechibidoworo uzọ rue ubọchi ọnwu-ha, nādi ndu dika ndinyom di-ha nwuru. 4 Eze we si Amasa, Kpọkọtaram ndikom Juda n'ubọchi atọ, gi onwe-gi guzo kwa n'ebe a. 5 Amasa we je ikpọkọta Juda: ma ọ nọrọ ọdù kari mb͕e akara àkà nke ọ kaworo ya. 6 Devid we si Abishai, Ub͕u a Sheba nwa Bikri gēmejọ ayi kari Absalom: gi onwe-gi chiri ndi-orù onye-mwe-gi, chua ya n'azu, ka o we ghara ichọtara onwe-ya obodo ufọdu ewusiri ike, we naputa onwe-ya n'anya-ayi. 7 Ndikom Joab we soro ya pua, ha na ndi Keret na ndi Pelet, na ndi-dike nile: ha we si na Jerusalem pua, ichu Sheba nwa Bikri n'azu. 8 Mb͕e ndi ahu nọ n'akuku nkume uku nke di na Gibeon, Amasa biara n'iru ha. Ma ekeworo Joab ihe-ọkiké, uwe-nwuda-ya ka o yikwasiri, ihe-ọkiké di kwa n'elu ya, ya na mma-agha ekekọtara n'úkwù-ya n'ọbọ-ya; ma mb͕e Joab putara mma-agha we dapu. 9 Joab we si Amasa, Ọ̀ bu n'udo ka i nọ, nwa-nnem? Joab we were aka-nri-ya jide Amasa n'afu-ọnu isutu ya ọnu. 10 Ma Amasa elezighi anya na mma-agha nke di n'aka Joab: o we were ya tie ya n'okpuru ọgiriga nke-ise, wusi ngiri-afọ-ya n'ala, ma o tighi kwa ya ọzọ; o we nwua. Joab na Abishai, bú nwa-nne-ya, we chua Sheba nwa Bikri n'azu. 11 Ma otù nwoke n'etiti umu-okorọbia Joab guzoro n'akuku ya, si, Onye ọ bula ihe Joab nātọ utọ, na onye ọ bula diri Devid, ya so Joab n'azu. 12 Ma Amasa nāturu n'ọbara n'etiti uzọ atuliri atuli. Nwoke ahu we hu na ndi Israel nile guzoro, o we bupu Amasa n'uzọ atuliri atuli chigharia n'ọhia, tukwasi uwe n'elu ya, mb͕e ọ huru na onye ọ bula nke biara n'ebe ọ di guzoro. 13 Mb͕e ebupusiri ya n'uzọ atuliri atuli, ndikom nile gabigara iso n'azu Joab, ichu Sheba nwa Bikri n'azu. 14 O we gabiga n'ebo nile nke Israel rue Ebel, na Bet-meaka, na ndi Bia nile: ewe kpọkọta ha, ha we bia so kwa ya n'azu. 15 Ha we bia nọchigide ya n'agha n'Ebel Bet-meaka, wukọta ihe-ntukọba imegide obodo ahu, o we guzo nime ékpè: ndi nile soro Joab nēbibimb͕idi, ime ka ọ da. 16 Otù nwayi nke mara ihe we si n'obodo ahu kpọ òkù, si, Nurunu, nurunu; biko, sinu Joab, Biarue nso n'ebe a, ka m'gwa gi okwu. 17 O we biarue ya nso; nwayi ahu we si, Gì onwe-gi bu Joab? Ọ si, Mu onwem bu ya. Nwayi ahu we si ya, Nuru okwu nile nke orù-gi nwayi. Ọ si Anamanu nọ̄. 18 Nwayi ahu we kwue, si, Ha nēkwu ekwu na mbu, si, Ha aghaghi iju ase n'Ebel: otú a ka ha kwuzu-kwa-ra okwu. 19 Mu onwem bu otù onye nime ndi-udo ndi kwesiri ntukwasi-obi n'Israel: gi onwe-gi nāchọ ime ka otù obodo na otù nne n'Israel nwua: n'ìhi gini ka i gēloda ihe-nketa Jehova? 20 Joab we za, si, Ya burum ihe-árú, ya burum ihe-árú; m'gaghi-eloda ma-ọli, m'gaghi-ebibi kwa ma-ọli. 21 Ọ bughi otú a ka okwu a di: kama otù nwoke nke sitere n'ugwu Efraim, Sheba nwa Bikri bu aha-ya, o weliri aka-ya imegide eze, bú imegide Devid: nyenum ya, nání ya, ka m'si n'obodo a la. Nwayi ahu we si Joab, Le, agātuputara gi isi-ya nime mb͕idi. 22 Nwayi ahu we biakute ndi obodo ahu nile n'amam-ihe-ya. Ha we bipu isi Sheba nwa Bikri, tupuru ya Joab. O we fùa opì-ike, ha we si n'obodo ahu b͕asa, nwoke ọ bula ọ la n'ulo-ikwū-ya. Joab we lata na Jerusalem jekuru eze. 23 Ma Joab bu onye-isi usu-ndi-agha nile nke Israel: Benaia nwa Jehoiada bu onye-isi ndi Keret, bu kwa onye-isi ndi Pelet: 24 Adoram bu onye-isi usu ndi nēfè òfùfè: Jehoshafat nwa Ahailud bu onye-ncheta: 25 Sheva bu ode-akwukwọ: Zedok na Abaiata bu ndi-nchu-àjà. 26 ọzọ kwa, Ira onye Jaia buru Devid onye-isi n'ije ozi.

2 Samuel 21

1 Oké unwu we di n'ubọchi Devid arọ atọ n'usoro, arọ na arọ; Devid we chọ iru Jehova. Jehova we si, Ọ bu n'ihi Sọl na n'ihi ulo ọbara ya, n'ihi na o mere ka ndi Gibeon nwua. 2 Eze we kpọ ndi Gibeon, si ha; (ma ndi Gibeon, ọ bughi n'umu Israel ka ha sitere, kama ha sitere na ndi-Amorait fọduru; ma umu Israel ṅuru ha iyi: ma Sọl chọrọ itib͕u ha n'ekworo n'ihi umu Israel na Juda: ) 3 Devid we si ndi Gibeon, Gini ka m'gēmere unu? gini kwa ka m'gēji kpuchie nmehie, ka unu we gọzie ihe-nketa Jehova? 4 Ndi Gibeon we si ya, Ọ dighi ọla-ọcha ma-ọbu ọla-edo diri ayi n'ebe Sọl nọ, ma-ọbu n'ebe ulo-ya nọ: ọ dighi kwa nwoke ọ bula agēme ka ọ nwuara ayi n'Israel. O we si, Ihe unu onwe-unu nāsi, ihe ahu ka m'gēmere unu. 5 Ha we si eze, Nwoke ahu nke mere ka ayi gwusia, nke zube-kwa-ra imegide ayi, ewe kpochapu ayi ka ayi ghara iguzo onwe-ayi n'ókè-ala ọ bula nke Israel, 6 ka enye ayi ndikom asa sitere n'umu-ya, ayi gākwuba kwa ha nye Jehova nime Gibea Sọl, onye Jehova rọputara. Eze we si, Mu onwem gēnye unu ha. 7 Ma eze nwere ọmiko n'aru Mefiboshet, nwa Jonatan nwa Sọl, n'ihi ọṅuṅu-iyi Jehova nke di n'etiti ha, bú n'etiti Devid na Jonatan nwa Sọl. 8 Eze we chiri umu-ndikom abua nke Rizpa nwa-nwayi Aia, ndi ọ muru Sọl, bú Amoni na Mefiboshet; na umu-ndikom ise nke Maikal nwa-nwayi Sọl, ndi ọ muru Adriel nwa Bazilai onye Mehola: 9 o we nye ha n'aka ndi Gibeon, ha we kwuba ha n'ugwu n'iru Jehova: ha asa we da n'otù: ma emere ka ndi ahu nwua n'ubọchi owuwe-ihe-ubi, n'ubọchi mbu, na nmalite obìbì ọka barley. 10 Rizpa nwa-nwayi Aia we chiri ákwà-nkpe, b͕asara onwe-ya n'elu oké nkume, site na nmalite owuwe-ihe-ubi rue mb͕e esi n'elu-igwe wukwasi ha miri-ozuzo; o kweghi kwa ka anu-ufe nke elu-igwe nọkwasi ha n'ehihie, ma-ọbu anu-ọhia n'abali. 11 Ewe gosi Devid ihe Rizpa nwa Aia, nwayi bu iko Sọl, mere. 12 Devid we je chiri ọkpukpu Sọl na ọkpukpu Jonatan nwa-ya n'aka ndi-nwe Jebesh-gilead, ndi zupuru ha n'amá Bet-shan, ebe ndi Filistia kwubara ha, n'ubọchi ndi Filistia tib͕uru Sọl nime Gilboa: 13 o we si n'ebe ahu chigota ọkpukpu Sọl na ọkpukpu Jonatan nwa-ya; ha chikọta-kwa-ra ọkpukpu ndi akwubara. 14 Ha we lìe ọkpukpu Sọl na Jonatan nwa-ya n'ala Benjamin nime Zela, n'ílì Kish, bú nna-ya: ha we me ihe nile eze nyere n'iwu. Ewe riọta Chineke aririọ bayere ala ahu mb͕e ihe a gasiri. 15 Ma ndi Filistia nwere agha ọzọ ha nēbuso Israel; Devid we rida, ya na ndi-orù-ya, buso ndi Filistia agha; Devid we da #mbà. 16 Ishbi-benob, nke di n'etiti umu Rafa, onye ọtùtù ube-ya di ọgu shekel ọla iri-na-ise n'ọtùtù, ekewo-kwa-ra onye ahu ihe-agha ọhu, o we si na ya gētib͕u Devid. 17 Ma Abishai nwa Zeruaia yere ya aka, tib͕ue onye Filistia ahu, me ka ọ nwua. Mb͕e ahu ndikom Devid ṅuru ya iyi, si, I gaghi eso ayi pua ibu agha ọzọ, ka i ghara imenyu oriọna Israel. 18 O rue, mb͕e ihe a gasiri, na agha di kwa ọzọ na Gob nke ebusoro ndi Filistia: mb͕e ahu Sibekai onye Husha tib͕uru Saf, nke di n'etiti umu Rafa. 19 Agha we di ọzọ na Gob ebusoro ndi Filistia; Elhanan nwa Jaare-oregim onye Bet-lehem we tib͕ue nwa-nne Gọlaiat onye Gat, onye osisi ube-ya di ka oké ókpòrò di arọ́ nke ọkpa-ákwà ji akpa ákwà. 20 Agha we di ọzọ na Gat, ma otú nwoke toro ogologo nọ n'ebe ahu, nkpisi aka-ya abua di isi isi, nkpisi ukwu-ya abua di kwa isi isi, ọnu-ọgugu-ha di orú na anọ; ma amu-kwa-ra onye ahu nye Rafa. 21 Ọ ta Israel uta, Jonatan nwa Shimai, bú nwa-nne Devid, we tib͕ue ya. 22 Madu anọ ndia ka amuru nye Rafa nime Gat; ha we da site n'aka Devid, na site n'aka ndi-orù-ya.

2 Samuel 22

1 Devid we gwa Jehova okwu nile nke abù a n'ubọchi Jehova naputara ya n'ọbu-aka ndi-iro-ya nile na n'ọbu-aka Sọl: 2 ọ we si, Jehova bu oké nkumem, na ebem ewusiri ike, na onye nēme ka m'b͕apu, Onye m'nwere; 3 Ọ bu Chineke nke oké nkumem, anamab͕abà nime Ya; Ọ bu ọtam, na mpi nke nzọputam, na ulo-elum, na ebe-nb͕alagam; Onye-nzọputam, I nāzọputam n'ihe-ike. 4 Onye-anēto eto ka Ọ bu, anamakpọku Jehova, Ewe zọputam n'aka ndi-irom. 5 N'ihi na ebili-miri nke ọnwu b͕aram buruburu, Miri-iyi nile nke jọb͕uru onwe-ya nēme ka m'tua egwu. 6 Udọ̀ nile nke ala-mọ dim buruburu; Ọnyà nile nke ọnwu biara n'irum. 7 Anamakpọku Jehova nime nkpà kparam, Ọ bu Chinekem ka m'nākpọku: O we si n'ulo uku Ya nu olum, Nkpu m'tikuru Ya ba-kwa-ra na nti-Ya abua. 8 Ala we me nkpatu ma kwa jijiji, Nto-ala nile nke elu-igwe nāma jijiji, Ewe me ka ha me nkpatu, n'ihi na iwe-Ya di ọku. 9 Anwuru-ọku rigoro n'imi-Ya, Ọku nēsi kwa n'ọnu-Ya ripia: Afunwuru icheku site na ya. 10 O rulata-kwa-ra elu-igwe, rida; Oké ọchichiri di kwa n'okpuru ukwu-Ya abua. 11 O we nọkwasi n'elu cherub dika inyinya, we fere: Ewe hu Ya n'elu nkù ìfùfè. 12 O we do ọchichiri buruburu Ya ka ọ buru ulo-ntu, Bú nchikọta miri, igwe-oji b͕ara ọchichiri nke mbara-ígwé. 13 Site n'onwunwu nke nēnwu n'iru YaAfunwuru icheku ọku. 14 Jehova si n'elu-igwe nāma éb͕è-elu-igwe, Onye kachasi ihe nile elu nēme kwa-ka olu-Ya da. 15 O we b͕a àkú-Ya, me ka ha b͕asa; Àmùmà kwa, O we chusa ha. 16 Ewe hu ebe osimiri si erù, Anēkpughe ntọ-ala nile nke elu-uwa dum madu bi, N'ibasi-nba-ike nke Jehova, Site n'ume nke iku-ume nke imi-Ya. 17 O si n'elu zìe, kurum, Dọputam n'ọtutu miri; 18 Ọ nānaputam n'aka onye-irom di ike, N'aka ndi nākpọm asì; n'ihi na ha nwere ume karim 19 Ha nābia n'irum n'ubọchi nhuju-anyam: Ma Jehova burum ihe-ndabere. 20 O we me ka m'puta rue ebe sara mbara: Ọ nādọputam, n'ihi na ihem tọrọ Ya utọ. 21 Jehova nēnyeghachim dika ezi ọmumem si di: Dika idi-ọcha akam abua si di, otú a ka Ọ nēmeghachim ọzọ. 22 N'ihi na edebewo uzọ nile nke Jehova, Emebighkwam iwu n'ipu n'aka Chinekem. 23 N'ihi na ikpé-Ya nile di n'irum: Ukpuru-Ya kwa, adighm-ewezuga onwem n'ebe ha di. 24 M'we zue okè n'ebe Ọ nọ, Edebe-kwa-ram onwem pua n'ajọ omumem. 25 Jehova we meghachim dika ezi omumem si di; Dika idi-ọcham n'anya-Ya si di. 26 N'ebe onye-ebere nọ I gēgosi Onwe-gi onye-ebere, N'ebe nwoke zuru okè nọ I gēgosi Onwe-gi onye zuru okè; 27 N'ebe onye di ọcha nọ I gēgosi Onwe-gi onye di ọcha; Ma n'ebe onye b͕agọro ab͕agọ nọ I gēgosi Onwe-gi Onye-nb͕á. 28 I gāzọputa kwa ndi ewedara n'ala: Ma anya-Gi abua dikwasi ndi di elu, ka I we me ka ha di ala. 29 N'ihi na Gi onwe-gi bu oriọnam, Jehova: Jehova nēme kwa ka ọchichirim nwue enwu. 30 N'ihi na m'nēsite na Gi b͕a ọsọ ichu usu ndi nāpunara madu ihe: Anamesite na Chinekem wubiga mb͕idi. 31 Chineke, uzọ-Ya zuru okè: Okwu-ọnu Jehova bu ihe anuchara anucha; Ọta ka ọ buru ndi nile nke nāb͕abà nime Ya. 32 N'ihi na ònye bu Chineke, ma-ọbughi Jehova? Ònye bu kwa oké nkume, ma-ọbughi Chineke-ayi? 33 Chineke bu ebem siri ike nke di ike nke-uku: Ọ nākwazu kwa uzọm. 34 O nēdozi ukwum ka ha di ka ukwu nne-ele: N'elu ebem di elu ka Ọ nēguzokwam. 35 O nēzí akam abua ibu agha; Ogwe-akam abua nārọgọ kwa uta ọla. 36 I nyewokwam ọta nzọputa-Gi: Ume-ala-n'obi nke Gi nēmekwam ka m'ba uba. 37 I nēme ka nzọ-ukwum sa mbara n'okpurum, Nkwonkwo-ukwum ab͕uchapughi kwa. 38 Ka m'chua ndi-irom, we kpochapu ha; Adighm-alaghachi kwa rue mb͕e emere ka ha gwusia. 39 M'we me ka ha gwusia, anamamapú kwa ha, ha agaghi-ebili kwa: Ha we da n'okpuru ukwum abua. 40 I nēji kwa ike kem dika ihe-ọkiké ibu agha: I nēme ka ndi nēbili imegidem ruru ala n'okpurum. 41 Ndi-irom, I nyewokwam olu-ha, Ndi nākpọm asì, anamekpochapu kwa ha. 42 Ha nāgha anya, ma ọ dighi onye nāzọputa ha; N'ebe Jehova nọ ka ha nāgha anya, ma Ọ zaghi ha. 43 Anamesu kwa ha me ka ha di ka ájá ala, Anamegwe ha me ka ha di ka apiti èzí, anametisa ha. 44 I we me ka m'b͕apu n'ilu-ọ̀gù nile nke ndim; I nēdebem ka m'buru isi mba nile ọzọ: Ndi m'nāmaghi gēfèm òfùfè. 45 Ndi ala ọzọ nērube isi aghughọ n'okpurum: Mb͕e ha nuru na nti ha nēgem nti. 46 Ndi ala ọzọ nāta aru, Ke onwe-ha ihe-ọkiké, si n'ebe-nmechibido-ha puta. 47 Jehova nādi ndu; Onye agọziri agọzi ka oké nkumem bu kwa; Chineke nke oké nkume nzọputam di kwa elu: 48 Bú Chineke ahu Nke nābọrọm ọ́bọ̀, Onye nēme kwa ka ndi di iche iche rida n'okpurum, 49 Onye nēme kwa ka m'si n'aka ndi-irom pua: I nēwelikwam elu kari ndi nēbili imegidem: I nānaputam n'aka madu nēme ihe ike. 50 N'ihi nka ka m'gēkele Gi, Jehova, n'etiti mba ọzọ, Aha-Gi ka m'gābùku kwa abù ọma. 51 Ọ nēme ka nzọputa eze-Ya di uku: Ọ nēme-kwa-ra onye nke Ya etere manu ebere, Bú Devid, Ọ nēme-kwa-ra nkpuru-ya ebere rue mb͕e ebighi-ebi.

2 Samuel 23

1 Ma ndi a bu okwu ikpe-azu nke Devid. Ihe nke si n'ọnu Devid nwa Jesi puta, Na ihe nke si n'ọnu nwoke ahu puta, bú onye emere ka o bilie, Bayere onye nke Chineke Jekob etere manu, Na onye nwere olu di utọ n'ibù abù ọma Israel: 2 Mọ nke Jehova kwuru site n'ọnum, Okwu-Ya di kwa n'irem. 3 Chineke Israel siri, Mu ka Oké Nkume Israel gwara okwu: Onye nāchi madu bu onye ezi omume, Ọ nāchi n'egwu Chineke 4 Ọ di kwa ka ìhè ututu, mb͕e anyanwu nāwa, Bú ututu igwe-oji nādighi; Mb͕e ahihia ndu nēpuputa n'ala, Site n'ọmumu-anyanwu, site na miri-ozuzo. 5 N'ihi na ọ bughi otú a ka ulom di n'ebe Chineke nọ; N'ihi na ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ka Ọ b͕aworo nyem, Bú ọb͕ub͕a-ndu edoworo n'usoro n'ihe nile, nke edebewo-kwa-ra: N'ihi na nzọputam nile, na ihe-utọ nile, N'ezie Ọ gaghi-eme ka o pute. 6 Ma ndi jọb͕uru onwe-ha di ka ogwu anēkopu ekopu, ha nile, N'ihi na ọ bughi aka ka eji ewere ha: 7 Ma nwoke nke nēmetu ha akaGēnweju ígwè na osisi ube aka: Agēwere kwa ọku suresia ha n'ọnọdu-ha. 8 Ndia bu aha ndi-dike, ndi Devid nwere; Josheb-bashebet onye-Tahkemonait, onye-isi nke ndi-ọchi-agha; onye ahu bu Adino onye-Eznait: onye nēmegide nnù ndikom abua eb͕uru n'otù ub͕ò. 9 Nke so ya bu Eleeza nwa Dodai nwa onye Ahoa, bú otù onye n'etiti ndi-dike atọ ahu ndi ha na Devid nọ mb͕e ha rara onwe-ha nye rue ọnwu n'etiti ndi Filistia ndi chikọtara onwe-ha n'ebe ahu ibu agha, ma ndikom Israel rigoro: 10 onye ahu biliri, tib͕u ndi Filistia rue mb͕e ike gwuru aka-ya, aka-ya we rapara na mma-agha: Jehova we zọputa nzọputa uku n'ubọchi ahu; ndi Israel we laghachi soro ya n'azu nání iyipu ihe di n'aru ndi eb͕uru eb͕u. 11 Nke so ya bu Shama nwa Agi onye-Hararait. Ndi Filistia we chikọta onwe-ha n'usu, ma òkè ubi di n'ebe ahu juputara na lentil; ma ndi Israel b͕apuru n'iru ndi Filistia. 12 O we guzo onwe-ya n'etiti òkè ahu, naputa ya, tib͕ue ndi Filistia: Jehova we zọputa nzọputa uku. 13 Ndikom atọ n'etiti orú ndi-isi na iri ahu we rida, biakute Devid n'owuwe-ihe-ubi rue ọb͕à Adulam; ma usu ndi Filistia amawo ulo-ikwū-ha na ndagwurugwu Refaim. 14 Ma Devid nọ n'ebe ahu ewusiri ike mb͕e ahu, ma ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia di na Bet-lehem mb͕e ahu. 15 Devid we chọsie ike, si, Ònye gēme ka m'ṅua miri sitere n'olùlù-miri Bet-lehem, nke di n'ọnu-uzọ-ama: 16 Ndi-dike atọ ahu we wapue ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia, sere miri n'olùlù-miri Bet-lehem, nke di n'ọnu-uzọ-ama, ha we būru ya, kutere Devid: ma o kweghi iṅu ya, o we wusiere ya Jehova. 17 Ọ si, Ya burum ihe-árú, Jehova, ime ihe a: #m'gāṅu ọbara ndikom ahu ndi ji ndu-ha n'aka-ha nēje? o kweghi kwa iṅu ya. Ihe ndia ka ndi-dike atọ ahu mere. 18 Ma Abishai, bú nwa-nne Joab, nwa Zeruaia, onye ahu bu onye-isi ndikom atọ ahu. Onye ahu feghari-kwa-ra ube-ya imegide ọgu ndikom iri-na-ise, ha we ghọ ndi eb͕uru eb͕u, o we nwe aha n'etiti ndikom atọ ahu. 19 Àdighi-asọpuru ya kari ndikom atọ ahu? o we ghọrọ ha onye-isi: ma o rughi ndikom atọ mbu ahu. 20 Benaia kwa, nwa Jehoiada, nwa nke nwoke bu dìnkpà nke Kabzeel, onye di uku n'ime ihe, onye ahu tib͕uru umu-ndikom abua nke Ariel nke Moab: onye ahu rida-kwa-ra tib͕ue ọdum n'etiti olùlù n'ubọchi snow nēzò. 21 Onye ahu tib͕u-kwa-ra nwoke ahu, bú onye Ijipt, bú nwoke mara nma ile anya: ube di kwa n'aka onye Ijipt ahu; ma o ji nkpa-n'aka ridakuru ya, napu ube ahu n'aka onye Ijipt n'ike, were ube-ya b͕ue ya. 22 Ihe ndia ka Benaia nwa Jehoiada mere, we nwe aha n'etiti ndi-dike atọ ahu. 23 Anāsọpuru ya kari orú ndikom na iri ahu, ma o rughi ndikom atọ mbu ahu. Devid we do ya ibà n'etiti ndi nānu okwu-ya. 24 Asahel nwa-nne Joab bu otù onye n'etiti orú ndikom na iri ahu; Elhanan nwa Dodo nke Bet-lehem; 25 Shama onye Harod, Elika onye Harod; 26 Hilez onye-Paltait, Ira nwa Ikesh onye Tekoa; 27 Abieza onye Anatot, Mebunai onye Husha; 28 Zalmon onye Ahoa, Maharai onye Netofa; 29 Hileb nwa Beana onye Netofa, Itai nwa Ribai nke Gibea umu Benjamin; 30 Benaia onye Piraton, Hidai nke miri-iyi Gaash; 31 Abi-albon onye Araba, Azmavet onye Bahurim; 32 Eliahba onye Shaalabin, nke umu Jashen, Jonatan; 33 Shama onye-Hararait, Ahiam nwa Shara onye-Ararait; 34 Elifelet nwa Ahasbai, nwa onye Meakat, Eliam nwa Ahitofel onye Gailo; 35 Hezro onye Kamel, Paarai onye Arab; 36 Igal nwa Netan nke Zoba, Bani onye Gad; 37 Zelek onye Amon, Naharai onye Beirot, onye nēbu ihe-agha Joab nwa Zeruaia; 38 Ira onye Jeta, Gareb onye Jeta; 39 Uraia onye Het: ha nile di orú ndikom na iri na asa.

2 Samuel 24

1 Iwe Jehova we di kwa ọku ọzọ megide Israel, O we kpalie Devid imegide ha, si, Je guta Israel na Juda. 2 Eze we si Joab, bú onye-isi usu-ndi-agha, nke di n'aka-ya, Biko, jegharia n'ebo nile nke Israel, site na Dan we rue Bia-sheba, gukọtanu ndi Israel, ka m'we mara ọnu-ọgugu ndi Israel. 3 Joab we si eze, Ka Jehova, bú Chineke-gi, tukwasi-kwa-ra ndi Israel, ka iba-uba ha bara ra, otù onye ọgu ise otù onye ọgu ise, ka anya onye-nwem, bú eze, hu kwa ya: ma onye-nwem, bú eze, n'ìhi gini ka ihe a nātọ ya utọ? 4 Ma okwu eze di ike n'ebe Joab nọ, na n'aru ndi-isi usu-ndi-agha. Joab na ndi-isi usu-ndi-agha we si n'iru eze pua igukọta ndi ahu, bú Israel. 5 Ha we gabiga Jọdan, ma ulo-ikwū-ha n'Aroea, n'aka-nri obodo ahu nke di n'etiti ndagwurugwu Gad, we rue Jeza: 6 ha we biarue Gilead, ru kwa ala Tahtim-họdshi; ha we biarue Dan-jaan, je buruburu rue Zaidon, 7 biarue ebe ewusiri ike nke Taia, na obodo nile nke ndi-Haivait na ndi Kenean, purue Negeb Juda, nime Bia-sheba. 8 Ha we jegharia n'ala nile, biarue Jerusalem n'ọgwugwu ọnwa iteghete na orú ubọchi. 9 Joab we nye eze ọnu-ọgugu nke ngukọta ọ gukọtara ndi Israel: ma orú nnù ndikom ọgu uzọ ise di n'Israel, ndi bu dìnkpà ndi nāmiputa mma-agha; ndikom Juda di kwa orú nnù ndikom ọgu uzọ atọ na uzọ abua na nnù iri. 10 Obi Devid we ta ya uta mb͕e ọ gusiri ndi Israel. Devid we si Jehova, Emehiewom nke-uku n'ihe m'meworo: ma ub͕u a, Jehova, biko me ka ajọ omume-orú-Gi gabiga; n'ihi na emewom ihe-nzuzu nke-uku. 11 Devid we bilie n'ututu, okwu Jehova we rue Gad nti, bú onye-amuma, onye-ọhu-uzọ nke Devid, si, 12 Je gwa Devid okwu, si, Otú a ka Jehova siri, Ihe atọ ka Mu onwem nēbokwasi gi; rọputara onwe-gi otù nime ha, ka M'we me gi ya. 13 Gad we biakute Devid, si, ya, Ọ̀ bu oké unwu arọ asa gābiakute gi n'ala-gi? mà-ọbu na i ganāb͕alaga n'iru ndi nākpab͕u gi ọnwa atọ, mb͕e ndi ahu nāchu gi: mà-ọbu na ajọ ọria nēfe efe gādi n'ala-gi ubọchi atọ? ub͕u a mata, le kwa okwu m'gēweghachiri Onye nēzitem. 14 Devid we si Gad, Anọm na nkpà nke-uku: biko, ka ayi dabà n'aka Jehova; n'ihi na obi-ebere-Ya bara uba: ma ka m'ghara idabà n'aka madu. 15 Jehova we tiye ajọ ọria nēfe efe n'aru Israel site n'ututu we rue na mb͕e ákàrà: orú nnù ndikom uzọ asatọ na nnù iri-na-ise we nwua n'etiti ndi Israel site na Dan we rue Bia-sheba. 16 Mọ-ozi we setipu aka-ya n'ebe Jerusalem di ibibi ya, Jehova we chègharia n'ihe ọjọ ahu we si mọ-ozi ahu nke nēbibi n'etiti ndi Israel, O zuwo; ub͕u a ra aka-gi. Ma mọ-ozi nke Jehova nọ n'akuku ebe-nzọcha-ọka nke Arọna onye Jebus. 17 Devid we gwa Jehova okwu, mb͕e ọ huru mọ-ozi ahu nke nētib͕u ndi Israel, ọ si, Le, mu onwem emehiewo, mu onwem emewo kwa ajọ omume: ma ìgwè aturu ndia, gini ka ha mere? biko, ka aka-Gi digidem, digide kwa ulo nnam. 18 Gad we biakute Devid n'ubochi ahu, si ya, Rigo, me ka ebe-ichu-àjà guzoro Jehova n'ebe-nzọcha-ọka nke Arọna onye Jebus. 19 Devid we rigo dika okwu Gad si di, dika Jehova nyere n'iwu. 20 Arọna we le anya, hu eze na ndi-orù-ya ka ha nāgabigakute ya: Arọna we puta, kpọ isi ala nye eze, kpuchie iru-ya n'ala. 21 Arọna we si, Gini mere onye-nwem, bú eze, biakuteworo orù-ya? Devid we si, Izuru ebe-nzọcha-ọka-gi n'aka-gi, iwuru Jehova ebe-ichu-àjà, ka ewe b͕ochie ihe otiti a n'ebe ndi Israel nọ. 22 Arọna we si Devid, Ka onye-nwem, bú eze were ihe di nma n'anya-ya sure ọku, le, ehi iji chu àjà-nsure-ọku, na ihe nzọcha-ọka nile na ihe ehi nile ka ha buru nkú: 23 ihe a nile onye-nwem eze ka Arọna, nyere eze. Arọna we si eze, Ka ihe-gi tọ Jehova, bú Chineke-gi, utọ 24 Eze we si Arọna, É-è; kama aghaghm izuru ya n'aka-gi n'ọnu-ahia: m'gaghi-esure-kwa-ra Jehova, bú Chinekem, àjà-nsure-ọku nke m'nētiyeghi ego ọ bula. Devid we were ọgu shekel ọla-ọcha abua na iri zuru ebe-nzọcha-ọka ahu na ehi ahu. 25 Devid we wuere Jehova ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, sure àjà-nsure-ọku na àjà-udo. Ewe riọta Jehova aririo bayere ala ahu, ewe b͕ochie ihe-otiti ahu n'ebe Israel nọ.

1 Ndi-Eze 1

1 Ma eze, bú Devid, ghọrọ agadi, ubọchi ndu-ya nāgwu; ha we chiri uwe kpuchie ya aru, ma aru-ya ekpoghi ọku. 2 Ndi-orù-ya we si ya, Ka ha chọrọ onye-nwem, bú eze, nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke: ka o guzo kwa n'iru eze, nēkposo kwa ya aru ọku; ka o dina kwa n'obi-gi, ka aru onye-nwem, bú eze, we kpo ọku. 3 Ha we chọ nwa-ab͕ọghọ mara nma n'ókè-ala nile nke Israel, we chọta Abishag onye Shunem, me ka ọ biakute eze. 4 Nwa-ab͕ọghọ ahu mara nma nke-uku; o we nēkposo eze aru ọku, je-kwa-ra ya ozi; ma eze amaghi aru-ya. 5 Ma Adonaija nwa Hagit nēweli onwe-ya elu, si, Mu onwem gābu eze: o we doziere onwe-ya ub͕ọ-ala, na ndi-inyinya, na ọgu ndikom abua na iri ndi nāb͕a ọsọ n'iru ya. 6 Ma ọ dighi mb͕e nna-ya mere ihe nēwuta ya n'ubọchi ndu-ya nile, si, Gini mere i meworo otú a? ọzọ kwa, onye ahu bu onye di nma n'aru nke-ukwu; nne-ya mu-kwa-ra ya mb͕e amusiri Absalom. 7 Okwu-ya we di n'ebe Joab nwa Zeruaia nọ, na n'ebe Abaiata onye-nchu-àjà nọ: ha we so Adonaija nēyere ya aka. 8 Ma Zedok, bú onye-nchu àjà, na Benaia nwa Jehoiada, na Netan, bú onye-amuma, na Shimai, na Rei, na ndi-dike ndi Devid nwere, esoghi kwa Adonaija. 9 Adonaija we chiri ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi na anu mara abuba chua àjà n'akuku nkume Zohelet, nke di n'akuku En-rogel; o we kpọ umu-nne-ya nile, bú umu-ndikom eze, na ndikom nile nke Juda, bú ndi-orù eze; 10 ma ọ kpọghi Netan, bú onye-amuma, na Benaia, na ndi-dike ahu, na Solomon, bú nwa-nne-ya. 11 Netan we gwa Bat-sheba, bú nne Solomon, okwu, si, Ì nughi na Adonaija nwa Hagit aghọwo eze, ma Devid, bú onye-nwe-ayi, amaghi? 12 Ma ub͕u a, biko, bia, ka m'dua gi ọdu, ka i we wepuga ndu-gi na ndu nwa-gi, bú Solomon. 13 Je bakwuru eze, bú Devid, si ya, Onye-nwem, bú eze, ọ̀ bughi gi onwe-gi ṅuru orù-gi nwayi iyi, si, N'ezie Solomon nwa-gi gābu eze mb͕e m'nwusiri, ya onwe-ya gānọkwasi kwa n'oche-ezem? ọ̀ bu kwa gini mere Adonaija ghọworo eze? 14 Le, mb͕e i nọ nākpayere eze uka n'ebe ahu, mu onwem gēso kwa gi n'azu bata, kwujue okwu-gi nile. 15 Bat-sheba we bakuru eze rue ime-ulo: ma eze aghọwo agadi nke-uku: Abishag, bú nwayi Shunem, nēje-kwa-ra eze ozi. 16 Bat-sheba we rube isi, kpọ isi ala nye eze. Eze we si, Gini ka i nāchọ? 17 Ọ si ya, Onye-nwem, gi onwe-gi were Jehova, bú Chineke-gi, ṅuara orù-gi nwayi iyi, si, N'ezie Solomon nwa-gi gābu eze mb͕e m'nwusiri, ya onwe-ya gānọkwasi kwa n'oche-ezem. 18 Ma ub͕u a, le, Adonaija aghọwo eze; ma ub͕u a, onye-nwem, bú eze, i maghi ya: 19 o we chiri ehi na anu mara abuba na ìgwè ewu na aturu riri nne chua àjà, kpọ kwa umu-ndikom nile nke eze, kpọ kwa Abaiata, bú onye-nchu-àjà, kpọ kwa Joab, bú onye-isi usu-ndi-agha: ma ọ kpọghi Solomon, bú orù-gi. 20 Ma gi onwe-gi, onye-nwem, bú eze, anya Israel nile dikwasi gi, ka i we gosi ha onye gānọkwasi n'oche-eze onye-nwem, bú eze, mb͕e ọ nwusiri. 21 Ma emeghi otú a, o gēru kwa, mb͕e onye-nwem, bú eze, soro nna-ya-hà dina n'ọnwu, na agāgu mu onwem na nwam, bú Solomon, na ndi-nmehie. 22 Ma, le, mb͕e ọ nọ nākpayere eze uka, Netan, bú onye-amuma, bata-kwa-ra. 23 Ha we gosi eze, si, Le, Netan, bú onye-amuma. O we bata n'iru eze, kpọ isi ala nye eze, kpuchie iru-ya n'ala. 24 Netan we si, Onye-nwem, bú eze, Ọ̀ bu gi onwe-gi siri, Adonaija gābu eze mb͕e m'nwusiri, ya onwe-ya gānọkwasi kwa n'oche-ezem? 25 N'ihi na ọ ridawo ta, chiri ehi na anu mara abuba na ìgwè ewu na aturu riri nne chua àjà, kpọ kwa umu-ndikom nile nke eze, kpọ kwa ndi-isi usu-ndi-agha, kpọ kwa Abaiata, bú onye-nchu-àjà; ma, le, ha nēri ihe nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu n'iru ya, si, Ka eze, bú Adonaija, di ndu. 26 Ma ọ kpọghm, ọbuná mu onwem, bú orù-gi, ọ kpọghi kwa Zedok, bú onye-nchu-àjà, ọ kpọghi kwa Benaia nwa Jehoiada, ọ kpọghi kwa Solomon, bú orù-gi. 27 Ọ̀ gābu na ihe a sitere n'aka onye-nwem, bú eze, ma i meghi ka ndi-orù-gi mara onye gānọkwasi n'oche-eze onye-nwem, bú eze, mb͕e ọ nwusiri? 28 Eze, bú Devid, we za, si, Kpọrọnum Bat-sheba. O we bata n'iru eze, guzo n'iru eze. 29 Eze we ṅua iyi, si, Jehova nādi ndu, Onye b͕aputaworo nkpuru-obim na nkpab͕u nile, 30 n'ezie dika m'were Jehova, bú Chineke Israel, ṅuara gi iyi, si, N'ezie Solomon nwa-gi gābu eze mb͕e m'nwusiri, ya onwe-ya gānọkwasi n'oche-ezem n'ọnọdum; n'ezie otú a ka m'gēme ta. 31 Bat-sheba we rube isi kpuchie iru-ya n'ala, kpọ isi ala nye eze, si, Ka onye-nwem, bú eze Devid, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi. 32 Eze, bú Devid, we si, Kpọrọnum Zedok, bú onye-nchu-àjà, kpọ kwa Netan, bú onye-amuma, kpọ kwa Benaia nwa Jehoiada. Ha we bia n'iru eze. 33 Eze we si ha, Chirinu ndi-orù onye-nwe-unu tiyere onwe-unu, me ka Solomon, bú nwam, nọkwasi n'inyinya mule nke m'nwere, me-kwa-nu ka ọ ridarue Gaihon: 34 ka Zedok, bú onye-nchu-àjà, na Netan, bú onye-amuma, te ya manu n'ebe ahu ibu eze Israel: fù-kwa-nu opì, si, Ka eze, bú Solomon, di ndu. 35 Unu gēso kwa ya n'azu rigota, ọ gābia kwa nọkwasi n'oche-ezem; ya onwe-ya gābu kwa eze n'ọnọdum: ọ bu kwa ya ka m'nyeworo iwu ibu onye-ndú Israel na Juda. 36 Benaia nwa Jehoiada we za eze, si, Amen: ka Jehova, bú Chineke nke onye-nwem eze, si otú a. 37 Dika Jehova nọyeworo onye-nwem, bú eze, Ya nọyere Solomon otú a, me kwa ka oche-eze-ya di uku kari oche-eze onye-nwem, bú eze Devid. 38 Zedok, bú onye-nchu-àjà, na Netan, bú onye-amuma, na Benaia nwa Jehoiada, na ndi Keret na ndi Pelet, we rida, me ka Solomon nọkwasi n'inyinya mule nke eze, bú Devid, me ka o jerue Gaihon. 39 Zedok, bú onye-nchu-àjà, we si n'Ulo-ikwū were mpi manu ahu, te Solomon. Ha we fùa opì-ike; ndì Israel nile we si, Ka eze, bú Solomon, di ndu. 40 Ndi Israel nile we so ya n'azu rigo, ndi Israel nēb͕u kwa ọ̀jà, nāṅuri kwa oké ọṅù, ala we b͕awa n'olu-ha. 41 Adonaija na ndi nile akpọrọ, bú ndi ya na ha nọ, we nu ya mb͕e ha onwe-ha risiri ihe. Joab we nu olu opì-ike ahu, si, Gini mere olu a nke obodo nāb͕a aghara? 42 Mb͕e ọ nọ nēkwu okwu, le, Jonatan nwa Abaiata, bú onye-nchu-àjà, biara: Adonaija we si, Bata; n'ihi na nwoke bu dìnkpà ka i bu, ọ bu kwa ezi ozi ọma ka i nēzì. 43 Jonatan we za, si Adonaija, N'ezie onye-nwe-ayi, bú eze Devid, emewo Solomon eze: 44 eze we ziga Zedok, bú onye-nchu-àjà, na Netan, bú onye-amuma, na Benaia nwa Jehoiada, na ndi Keret na ndi Pelet, tiyere ya, ha emewo kwa ka ọ nọkwasi inyinya mule eze nwere: 45 Zedok, bú onye-nchu-àjà, na Netan, bú onye-amuma, etewo kwa ya manu ibu eze na Gaihon: ha esiwo kwa n'ebe ahu rigo nāṅuri ọṅu, obodo we b͕a aghara. Nka bu olu unu nuworo, 46 Ọzọ kwa, Solomon anọkwasiwo n'oche-eze nke ala-eze. 47 Ọzọ kwa, ndi-orù eze biara igọzi onye-nwe-ayi, bú eze Devid, si, Chineke-gi me ka aha Solomon di nma kari aha-gi, me kwa ka oche-eze-ya di uku kari oche-eze-gi: eze we kpọ isi ala n'elu ihe-ndina-ya. 48 Ọzọ kwa, otú a ka eze siri, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke Israel, bu, Onye nyeworom ta onye nānọkwasi n'oche-ezem, anyam nāhu kwa ya. 49 Ndi nile akpọrọ akpọ ndi Adonaija nwere we ma jijiji, bilie, je, nwoke ọ bula n'uzọ-ya. 50 Ma Adonaija turu egwu n'ihi Solomon; o we bilie, je, jide mpi ebe-ichu-àjà. 51 Ewe gosi Solomon, si, Le, Adonaija nātu egwu eze, bú Solomon: ma, le, o jidewo mpi ebe-ichu-àjà aka, si, Ka eze, bú Solomon, buru uzọ ṅuaram iyi na ọ gaghi-ewere mma-agha me ka orù-ya nwua. 52 Solomon we si, Ọ buru na ọ ghọ onye nēme nke-ọma, ọ dighi otù nime agiri-isi-ya gāda n'ala: ma ọ buru na ahuta ihe ọjọ n'aru ya, ọ gānwu kwa. 53 Eze, bú Solomon, we ziga, ha we me ka o si n'ebe-ichu-àjà rida. Ọ we bia kpọ isi ala nye eze Solomon: Solomon we si ya, La n'ulo-gi.

1 Ndi-Eze 2

1 Ma ubọchi Devid biaruru nso ka ọ nwua; o we nye Solomon, bú nwa-ya, iwu, si, 2 Mu onwem nēje n'uzọ uwa nile: ma di ike, buru kwa nwoke; 3 debe kwa ihe-ndebe nke Jehova, bú Chineke-gi, ije n'uzọ-Ya nile, idebe ukpuru-Ya nile, na ihe nile O nyere n'iwu, na ikpé-ya nile, na ihe-àmà-Ya nile, dika ihe edere n'iwu Moses si di, ka i we nwe uche n'ihe ọ bula nke i nēme, na n'ebe ọ bula i nēche iru-gi: 4 ka Jehova we me ka okwu-Ya guzosie ike nke O kwuru bayerem, si, Ọ buru na umu-gi elezie uzọ-ha anya, ijeghari n'irum n'ezi-okwu n'obi-ha nile na na nkpuru-obi-ha nile, agaghi-ebipu n'ulo-gi onye nwe inọdu n'oche-eze Israel, ka O kwuru. 5 Ọzọ kwa, gi onwe-gi amawo ihe Joab nwa Zeruaia merem, ihe o mere ndi-isi abua nke usu-ndi-agha nile nke Israel, bú Abnea nwa Nea na Amasa nwa Jeta, na o b͕uru ha, we wusi ọbara agha n'udo, tiye ọbara agha n'ihe-ọkiké-ya nke di n'úkwù-ya, na n'akpukpọ-ukwu-ya nke di n'ukwu-ya abua. 6 Gi me kwa dika amam-ihe-gi si di, ma ekwela ka isi-awọ-ya rida n'ala-mọ n'udo. 7 Ma mere umu Bazilai, bú onye Gilead, ebere, ka ha di kwa n'etiti ndi nēri ihe na table nke gi: n'ihi na otú a ka ha biakuterem mb͕e m'b͕apuru n'iru Absalom, bú nwa-nne-gi. 8 Ma, le, ọ di n'aka-gi, bú Shimai nwa Gira, bú onye Benjamin, nke Bahurim, onye ya onwe-ya kọcharam nkọcha jọb͕uru onwe-ya n'ubọchi m'jere Mahanaim: ma ya onwe-ya ridara izutem na Jọdan, m'we were Jehova ṅuara ya iyi, si, M'gaghi-ewere mma-agha me ka i nwua ma-ọli. 9 Ma ub͕u a agula ya n'onye ikpe nāmaghi, n'ihi na onye mara ihe ka i bu; i gāmara kwa ihe i gēme ya, ma i gēme ka isi-awọ-ya rida n'ala-mọ n'ọbara. 10 Devid we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'obodo Devid. 11 Ma ubọchi Devid bu eze Israel di ọgu arọ abua: arọ asa ka ọ bu eze na Hebron, orú arọ na iri na atọ ka ọ bu kwa eze na Jerusalem. 12 Solomon we nọkwasi n'oche-eze Devid nna-ya: ewe me ka ala-eze-ya guzosie ike nke-uku. 13 Adonaija nwa Hagit we biakute Bat-sheba nne Solomon. Ọ si, Ọ̀ bu n'udo ka i biaworo? Ọ si, Ọ bu n'udo. 14 Ọ si kwa, Enwerem okwu igwa gi. Ọ si, Kwue. 15 Ọ si, Gi onwe-gi amawo na ọ bu mu nwe ala-eze, ọ bu kwa mu ka Israel nile doro iru-ha, ka m'buru eze: ma ala-eze chighariri, we ghọ ihe diri nwa-nnem: n'ihi na o sitere n'aka Jehova diri ya. 16 Ma ub͕u a otù aririọ ka mu onwem nāriọ n'aka-gi, achughachila irum. Ọ si ya Kwue. 17 Ọ si, Biko, si Solomon, bú eze, (n'ihi na ọ gaghi-achughachi iru-gi, ) ka o nyem Abishag, bú nwayi Shunem, na nwunye. 18 Bat-sheba we si, Ọ di nma; mu onwem gāgwara gi eze okwu. 19 Bat-sheba we bakuru eze, bú Solomon, igwa ya okwu bayere Adonaija. Eze we bilie izute ya, we kpọ isi ala nye ya, nọkwasi n'oche-eze-ya, dọbara nne eze oche-eze; o we nọdu n'aka-nri-ya. 20 Ọ si, Ọ bu aririọ ntà ka mu onwem nāriọ n'aka-gi; achughachila irum. Eze we si ya, Riọ, nnem: n'ihi na m'gaghi-achughachi iru-gi. 21 Ọ si, Ka ewere Abishag, bú nwayi Shunem, nye Adonaija, bú nwa-nne-gi, na nwunye. 22 Eze, bú Solomon, we za, si nne-ya, N'ìhi gini kwa ka gi onwe-gi nāriọrọ Adonaija Abishag, bú nwayi Shunem? riọ-kwa-ra ya ala-eze; n'ihi na ya onwe-ya bu nwa-nnem nke-okenye; riọrọ ya ala-eze, riọ-kwa-ra Abaiata, bú onye-nchu-àjà, riọ-kwa-ra Joab nwa Zeruaia. 23 Eze, bú Solomon, we were Jehova ṅua iyi, si, Chineke mem otú a, mekwam ihe ọzọ otú a, asi na ọ bughi imegide ndu-ya ka Adonaija kwuworo okwu a. 24 Ma ub͕u a Jehova nādi ndu, Onye meworo ka m'guzosie ike, O me kwa ka m'nọkwasi n'oche-eze Devid, bú nnam, Jehova Onye mewo-kwa-ram ulo, dika O kwuru, n'ezie agēme ka Adonaija nwua ta. 25 Eze, bú Solomon, we zìe ozi n'aka Benaia nwa Jehoiada; o we dakwasi ya, o we nwua. 26 Eze we si Abaiata, bú onye-nchu-àjà, La n'Anatot, rue ubi-gi; n'ihi na nwoke kwesiri ọnwu ka i bu: ma m'gaghi-eme ka i nwua n'ubọchi ta, n'ihi na i būru ib͕e Onye-nwe-ayi Jehova n'iru Devid, bú nnam, na n'ihi na ewedara gi n'ala n'ihe nile nke ewedara nnam n'ala nime ya. 27 Solomon we chupu Abaiata ka ọ ghara iburu Jehova onye-nchu-àjà; ka o we me ka okwu Jehova rè, bú nke O kwuru bayere ulo Ilai nime Shailo. 28 Akukọ ahu we rue Joab nti: n'ihi na Joab wezugara onwe-ya iso Adonaija n'azu, ọ bu ezie na o wezugaghi onwe-ya iso Absalom n'azu. Joab we b͕alaga n'Ulo-ikwū Jehova, jide mpi ebe-ichu-àjà. 29 Ewe gosi eze, bú Solomon, si, Joab ab͕alagawo n'Ulo-ikwū Jehova, ma, le, ọ nọ n'akuku ebe-ichu-àjà. Solomon we ziga Benaia nwa Jehoiada, si, Je, dakwasi ya. 30 Benaia we biarue Ulo-ikwū Jehova, si ya, Otú a ka eze siri, Puta. Ọ si, É-è; kama n'ebe a ka m'gānwu. Benaia we weghachiri eze okwu, si, Otú a ka Joab kwuru, ọ bu kwa otú a ka ọ zaram. 31 Eze we si ya, Me dika o kwuworo, dakwasi ya, lì kwa ya; ka i we si n'ebe m'nọ na n'ebe ulo nnam nọ wezuga ọbara awusiri n'efu, nke Joab wusiri. 32 Jehova gēme kwa ka ọbara-ya laghachi n'isi-ya, n'ihi na ọ dakwasiri ndikom abua bu ndi ezi omume na ndi di nma kari ya, o were mma-agha b͕ue ha, ma nnam, bú Devid, amaghi ya, bú Abnea nwa Nea, onye-isi usu-ndi-agha Israel, na Amasa nwa Jeta, onye-isi usu-ndi-agha Juda. 33 Ọbara-ha gālaghachi kwa n'isi Joab, na n'isi nkpuru-ya rue mb͕e ebighi-ebi: ma udo gādiri Devid, di-kwa-ra nkpuru-ya, di-kwa-ra ulo-ya, di-kwa-ra oche-eze-ya, rue mb͕e ebighi-ebi, site na Jehova. 34 Benaia nwa Jehoiada we rigo, dakwasi ya, me ka ọ nwua; ewe lìe ya n'ulo-ya n'ọzara. 35 Eze we tiye Benaia nwa Jehoiada n'ọnọdu-ya ka ọ buru onye-isi usu-ndi-agha: Zedok, bú onye-nchu-àjà, ka eze tiyere n'ọnọdu Abaiata. 36 Eze we ziga kpọ Shimai, si ya, Wuere onwe-gi ulo na Jerusalem, biri n'ebe ahu, esi-kwa-la n'ebe ahu pua je ebe ọ bula. 37 O gēru kwa, n'ubọchi i gāpu, gabiga miri-iyi Kidron, na i gāmara nke-ọma na i ghaghi inwu: ọbara-gi gādi n'isi-gi. 38 Shimai we si eze, Okwu a di nma: dika onye-nwem, bú eze, kwuworo, otú a ka orù-gi gēme. Shimai we biri na Jerusalem ọtutu ubọchi. 39 O rue, n'ọgwugwu arọ atọ, na ndi-orù abua Shimai nwere b͕akuru Ekish, nwa Meaka, eze Gat. Ha we gosi Shimai, si, Le, ndi-orù-gi nọ na Gat. 40 Shimai we bilie, jikwa inyinya-ibu-ya, jerue Gat, jekuru Ekish, ichọ ndi-orù-ya: Shimai we je, me ka ndi-orù ya si na Gat biaghachi. 41 Ewe gosi Solomon na Shimai esiwo na Jerusalem je rue Gat, lata kwa. 42 Eze we ziga kpọ Shimai, si ya, Èmeghm ka i were Jehova ṅua iyi, m'we b͕ara gi àmà, si, Mara nke-ọma, na i ghaghi inwu n'ubọchi i gāpu je n'ebe ọ bula? i we sim, Ọ di nma, bú okwu m'nuru. 43 Ọ̀ bu kwa gini mere i nēdebeghi iyi Jehova, na ihe enyere n'iwu nke m'nyere gi n'iwu? 44 Eze si-kwa-ra Shimai, Gi onwe-gi mara ihe ọjọ nile nke obi-gi mara, nke i mere Devid, bú nnam: Jehova gēme kwa ka ihe ọjọ gi laghachi n'isi-gi. 45 Ma eze, bú Solomon, bu onye agọziri agọzi, agēme kwa ka oche-eze Devid guzosie ike n'iru Jehova rue mb͕e ebighi-ebi. 46 Eze we nye Benaia nwa Jehoiada iwu; ọ pua, dakwasi ya, ọ we nwua. Ewe me ka ala-eze guzosie ike n'aka Solomon.

1 Ndi-Eze 3

1 Solomon we ghọ ọgọ Fero eze Ijipt, kuru nwa-nwayi Fero, me ka ọ bata n'obodo Devid, rue mb͕e o wusiri ulo-ya, na ulo Jehova, na mb͕idi Jerusalem buruburu. 2 Nání na ndi Israel nāchu àjà n'ebe nile di elu, n'ihi na ọ dighi ulo ewuru aha Jehova rue mb͕e ahu. 3 Ma Solomon huru Jehova n'anya, nēje ije n'ukpuru nile nke Devid, bú nna-ya: ọ bu nání na ya onwe-ya nāchu àjà, nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe di elu. 4 Eze we jerue Gibeon ichu àjà n'ebe ahu; n'ihi na nke ahu bu oké ebe di elu: nnù àjà-nsure-ọku abua na ọgu iri ka Solomon surere n'elu ebe-ichu-àjà ahu. 5 Na Gibeon ka Jehova mere ka Solomon hu Ya anya na nrọ nke abali: Chineke we si, Riọ ihe M'gēnye gi. 6 Solomon we si, Gi onwe-gi emeworo orù-Gi, bú Devid nnam, ebere uku, dika o jere ije n'iru Gi n'ezi-okwu na n'ezi omume, na nime obi ziri ezi n'ebe I nọ; I we debere ya ebere uku a, nye ya nwa-nwoke nke nānọkwasi n'oche-eze-ya, dika ọ di ta. 7 Ma ub͕u a, Jehova, bú Chinekem, Gi onwe-gi emewo orù-Gi eze n'ọnọdu Devid, bú nnam: ma mu onwem bu nwatakiri; amaghm ipu apu na ibata abata. 8 Orù-Gi nọ kwa n'etiti ndi-Gi I rọputaworo, ndi bara uba, ndi anādighi-aguta ha, ndi anādighi-agu kwa ha ọnu, n'ihi iba-uba-ha. 9 Ma nye orù-Gi obi nānu ihe ikpe ndi-Gi ikpe, ighọta ihe di iche n'etiti ezi ihe na ihe ọjọ; n'ihi na ònye puru ikpe ndi-Gi nka di arọ́ ikpe? 10 Okwu-ya we di nma n'anya Onye-nwe-ayi, na Solomon riọrọ ihe a. 11 Chineke we si ya, N'ihi na i riọrọ ihe a, ma i riọghi nye onwe-gi ọtutu ubọchi; i riọghi kwa àkù nye onwe-gi, i riọghi kwa ndu ndi-iro-gi; kama i riọworo onwe-gi nghọta inu ikpé; 12 le, emewom dika okwu-gi si di: le, enyewom i obi mara ihe na nke nāghọta ihe; ya mere ọ dighi onye dika gi buru gi uzọ nọ, ọ dighi kwa onye gēbili dika gi n'azu gi. 13 Ọzọ kwa, enyewom i ihe i nāriọghi, ma àkù ma nsọpuru, ya mere ọ dighi nwoke ọ bula n'etiti ndi-eze gādi ka gi ubọchi-gi nile. 14 Ọ buru kwa na i je ije n'uzọm nile, idebe ukpurum nile na ihe nile M'nyere n'iwu dika nna-gi, bú Devid, jere, M'gēme kwa ka ubọchi-gi di ogologo. 15 Solomon we teta, ma, le, ọ bu nrọ: o we bata na Jerusalem, guzo n'iru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Onye-nwe-ayi, sure àjà-nsure-ọku, chua àjà-udo, mere ndi-orù-ya nile oké oriri. 16 Mb͕e ahu ndinyom abua, bú ndi nākwa iko, biakutere eze, guzo n'iru ya. 17 Otù nwayi we si, Biko, onye-nwem, Mu onwem na nwayi a nēbi n'otù ulo; m'we mua nwa mb͕e mu na ya nọ n'ulo. 18 O rue, n'ubọchi nke-atọ mb͕e m'musiri nwa, na nwayi a mu-kwa-ra nwa; ayi onwe-ayi nọ kwa n'otù ebe; ọ dighi onye ala ọzọ ayi na ya nọ n'ulo, nání ayi abua nọ n'ulo. 19 Nwa nwayi a we nwua n'abali; n'ihi na o dinakwasiri ya. 20 O we bilie n'etiti abali, kupu nwam n'akukum, ma orù-gi nwayi nāraru ura, o we dọba ya n'obi-ya, ma nwa-ya nke nwuru anwu ka ọ dọbara n'obim. 21 M'we bilie n'ututu inye nwam ara, ma, le, ọ nwuwo: m'we tule ya n'ututu, ma, le, ọ bughi nwam nke m'muru. 22 Nwayi nke-ọzọ we si, É-è; kama nke di ndu bu nwam, nke nwuru anwu bu kwa nwa-gi. Ma nke-mbu nāsi, É-è; kama nke nwuru anwu bu nwa-gi, nke di ndu bu kwa nwam. Ha we kwue otú a n'iru eze. 23 Eze we si, Otù nwayi nāsi, Nka nke di ndu bu nwam, ma nwa-gi bu nke nwuru anwu: ma nke-ọzọ nāsi, É-è; kama nwa-gi bu nke nwuru anwu, ma nwam bu nke di ndu. 24 Eze we si, Wetaram mma-agha. Ha we weta mma-agha n'iru eze. 25 Eze we si, Kpọwanu nwa di ndu abua, nye otù nwayi otù nkera, nye kwa nwayi nke-ọzọ nkera ọzọ. 26 Nwayi ahu nke nwere nwa di ndu we si eze, (n'ihi na afọ chighariri ya n'aru nwa-ya, ) o we si, Biko, onye-nwem, nyenu ya nwa di ndu, unu eme-kwa-la ka ọ nwua ma-ọli. Ma nwayi nke-ọzọ nāsi, M'gaghi-enwe ya, i gaghi-enwe kwa ya; kpọwanu ya. 27 Eze we za, si, Nyenu ya nwa di ndu, unu eme-kwa-la ka ọ nwua ma-ọli: nwayi a bu nne-ya. 28 Israel nile we nu ikpe eze kpere; ha we tua egwu eze: n'ihi na ha huru na amam-ihe Chineke di nime ya, ime ihe ekpere n'ikpe.

1 Ndi-Eze 4

1 Eze, bú Solomon, we buru eze Israel nile. 2 Ma ndia bu ndi-isi o nwere; Azaraia nwa Zedok bu onye-nchu-àjà; 3 Elihoref na Ahaija, umu-ndikom Shisha, bu ndi-ode-akwukwọ; Jehoshafat nwa Ahailud bu onye-ncheta; 4 Benaia nwa Jehoiada bu onye-isi usu-ndi-agha; Zedok na Abaiata bu ndi-nchu-àjà; 5 Azaraia nwa Netan bu onye-isi nke ndi edoro ndi-isi; Zabud nwa Netan bu onye-isi n'ije ozi na eyì eze; 6 Ahisha bu onye-isi ulo eze; Adonairam nwa Abda bu onye-isi usu ndi nēfè òfùfè. 7 Solomon nwe-kwa-ra ndikom iri na abua edoro ndi-isi Israel nile, ndi nāzù eze na ulo-ya: nwoke ọ bula nime ha nwe izù eze otù ọnwa n'arọ. 8 Ndia bu kwa aha-ha: Ben-hua, n'ugwu Efraim: 9 Ben-deka, nime Makaz, na nime Shaalbim na Bet-shemesh, na Ilon-bet-hanan: 10 Ben-hesed, n'Arubot; ya nwere Soko na ala Hefa nile: 11 Ben-abinadab, n'ebe nile di elu nke Doa; Tafat nwa Solomon ka ọ nwere na nwunye: 12 Beana nwa Ahailud, nime Teanak na Megido, na Bet-shean nile nke di n'akuku Zaretan, n'okpuru Jezreel, site na Bet-shean rue Ebel-mehola, rue ofè Jọkmeam: 13 Ben-geba, nime Remot-gilead; ya nwere Havot nke Jaia nwa Manase, nke di na Gilead; ya nwere akuku Agob, nke di na Beshan, ọgu obodo uku atọ nke nwere mb͕idi na nkpọrọ ọla: 14 Ahinadab nwa Ido, nime Mahanaim: 15 Ahimaaz, nime Naftali; onye ahu lu-kwa-ra Basemat nwa Solomon na nwunye: 16 Beana nwa Hushai, n'Asha na Bealot: 17 Jehoshafat nwa Parua, n'Isaka: 18 Shimai nwa Ila, nime Benjamin: 19 Gebea nwa Uri, n'ala Gilead, bú ala Saihon eze ndi-Amorait na nke Og, bú eze Beshan; ma nání ya bu onye edoro onye-isi nke di n'ala ahu. 20 Juda na Israel di ọtutu, dika ájá nke di n'akuku oké osimiri n'iba-uba, nēri ihe, nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, nāṅuri kwa ọṅu. 21 Solomon we nāchi ala-eze nile site n'Osimiri rue ala ndi Filistia, ru kwa ókè-ala Ijipt: ha nēweta nso onyinye-inata-iru-ọma, nēfè kwa Solomon òfùfè ubọchi nile nke ndu-ya. 22 Ihe-oriri Solomon nke diri otù ubọchi bu kwa orú ọtùtù ọka na iri nke utu ọka flour, na ọgu ọtùtù ọka atọ nke utu ọka; 23 ehi iri mara abuba, na orú ehi site n'ebe anāzù anu, na ọgu aturu ise, nāgughi ele, na mb͕ada, na ob͕o-miri, na ọkuku emere ka ha ma abuba. 24 N'ihi na ya onwe-ya nwere ike n'aru ndi nile bi n'ofè Osimiri, site na Tifsa we rue Geza, bú n'aru eze nile n'ofè Osimiri: o nwe-kwa-ra udo site n'ofè ọzọ nile di ya buruburu. 25 Juda na Israel we biri na ntukwasi-obi, nwoke ọ bula n'okpuru osisi vine ya na n'okpuru osisi fig ya, site na Dan we rue na Biasheba, ubọchi nile nke Solomon. 26 Solomon nwe-kwa-ra orú nnù ulo uzọ ise nke inyinya diri ub͕ọ-ala-ya, na orú nnù ndi-inyinya na nnù iri. 27 Ndi ahu edoro ndi-isi zù-kwa-ra eze, bú Solomon, na ndi nile nābiaru table nke eze Solomon nso, nwoke ọ bula n'ọnwa-ya: ha ekweghi ka ihe ọ bula kọ ukọ. 28 Ha nēweta kwa ọka barley na okporo-ọka n'ebe ndi ahu edoro ndi-isi nọ, nwoke ọ bula dika ihe ekpere ya n'ikpe si di, inye inyinya na inye inyinya ukwu ọsọ. 29 Chineke nye-kwa-ra Solomon amam-ihe na nghọta riri nne nke-uku, na obi sara mbara, dika ájá nke di n'usọ oké osimiri. 30 Amam-ihe Solomon we ba uba kari amam-ihe umu Iru-anyanwu nile, kari kwa amam-ihe Ijipt nile. 31 Ọ we mara ihe kari madu nile; kari Itan onye-Ezrahait, na Himan, na Kalkol, na Dada, bú umu-ndikom Mahol: aha-ya we di na mba nile b͕ara ha buruburu. 32 Ọ tua nnù ilu asa na ọgu iri: abù-ya di kwa nnù abua na ọgu iri na abù ise. 33 O kwu-kwa-ra okwu bayere osisi, site na cedar nke di na Lebanon we rue hyssop nke nēpuputa na mb͕idi: o kwu-kwa-ra okwu bayere anu, baye-kwa-ra anu-ufe, baye-kwa-ra ihe nākpu akpu, baye-kwa-ra azù. 34 Ha we si na ndi nile bia inu amam-ihe Solomon, si n'eze nile nke uwa, bú ndi nuru amam-ihe-ya.

1 Ndi-Eze 5

1 Hairam, bú eze Taia, we zìe ndi-orù-ya jekuru Solomon: n'ihi na ọ nuru na ya ka ha tere manu ibu eze n'ọnọdu nna-ya: n'ihi na onye nāhu Devid n'anya ubọchi nile ka Hairam bu. 2 Solomon we zigara Hairam ozi, si, 3 Gi onwe gi amawo Devid, bú nnam, na ọ pughi iwuru aha Jehova, bú Chineke-ya, ulo n'ihi agha nke b͕ara ya buruburu, rue mb͕e Jehova tiyere ha n'okpuru ọbu-ukwu-ya abua. 4 Ma ub͕u a Jehova, bú Chinekem, emewo ka m'zuru ike buruburu; ọ dighi onye-nmegide, ọ dighi kwa ihe ọjọ daputara ayi. 5 Ma, le, m'nāsi na m'gēwuru aha Jehova, bú Chinekem, ulo, dika Jehova gwara Devid, bú nnam, okwu, si, Nwa-gi, onye M'gētiyekwasi n'oche-eze-gi n'ọnọdu gi, ya onwe-ya gēwuru aham ulo. 6 Ma ub͕u a nye iwu ka ha b͕utuerem osisi cedar site na Lebanon; ndi-orùm gēso kwa ndi-orù-gi; m'gēnye kwa gi ugwọ-ọlu ndi-orù-gi dika ihe nile si di nke i gāsim: n'ihi na gi onwe-gi amawo na ọ dighi nwoke n'etiti ayi mara ib͕utu osisi dika ndi Zaidon. 7 O rue, mb͕e Hairam nuru okwu nile nke Solomon, na ọ ṅuriri ọṅu nke-uku, si, Onye agọziri agọzi ka Jehova bu ta, Onye nyeworo Devid nwa mara ihe ibu onye-isi ndi uku a. 8 Hairam we zigara Solomon ozi, si, Anuwom ozi nke i ziterem: mu onwem gēme ihe nile nātọ gi utọ bayere osisi cedar, baye-kwa-ra osisi fir. 9 Ndi-orùm gēsi na Lebanon buputa ha oké osimiri: mu onwem gāb͕a kwa ha ka ha se n'elu oké osimiri rue ebe ahu nke i gēziterem ozi, m'gātọsa kwa ha n'ebe ahu, gi onwe-gi gēburu kwa ha: gi onwe-gi gēme kwa ihe nātọm utọ, n'inye ulom nri. 10 Hairam we nēnye Solomon osisi cedar na osisi fir, bú ka ihe nile nātọ ya utọ ra. 11 Solomon we nye Hairam orú nnù ọtùtù ọka uzọ abua na nnù iri nke ọka wheat iburu ulo-ya ihe-oriri, na orú ọtùtù cor nke manu asuru asu: otú a ka Solomon nēnye Hairam kwa-arọ. 12 Jehova nye-kwa-ra Solomon amam-ihe, dika Ọ gwara ya; udo we di n'etiti Hairam na Solomon; ha abua we b͕a ndu. 13 Eze, bú Solomon, we weputa usu ndi nēfè òfùfè n'Israel nile; usu ahu ndi nēfè òfùfè bu orú nnù ndikom uzọ atọ na nnù iri-na-ise. 14 O ziga ha na Lebanon, orú nnù ndikom na nnù ise n'ọnwa na nb͕anwe: otù ọnwa ka ha nọ na Lebanon, ọnwa abua n'ulo: Adonairam bu kwa onye-isi usu ndi nēfè òfùfè. 15 Solomon nwe-kwa-ra orú nnù ndikom uzọ asatọ na nnù iri-na-ise ndi nēbu ibu, na orù nnù ndikom uzọ iri ndi nāwa ihe-ọwuwa n'ugwu; 16 nāgughi ndi-isi nke ndi edoro ndi-isi, bú ndi Solomon nwere, ndi bu isi n'ije-ozi ahu, nnù ndikom asatọ na ọgu ise, ndi nwere ike n'aru ndi ahu ndi nālu ọlu n'ije-ozi ahu. 17 Eze we nye iwu, ha we bute nkume uku, nkume di oké ọnu-ahia, iwere nkume awaputara awaputa tọ ntọ-ala ulo ahu. 18 Ndi-owu-ulo nke Solomon na ndi-owu-ulo nke Hairam na ndi Gebal we, dozie osisi na nkume iwu ulo ahu.

1 Ndi-Eze 6

1 O rue, n'arọ nke-nnù-na-ọgu-anọ site na mb͕e umu Israel siri n'ala Ijipt putasia, n'arọ nke-anọ nke Solomon bu eze Israel, n'ọnwa Ziv, nke bu ọnwa nke-abua, na o wubere Jehova ulo. 2 Ma ulo ahu nke eze, bú Solomon, wuru Jehova, ọgu cubit atọ ka ogologo-ya di, orú cubit ka obosara-ya di, orú cubit na iri ka idi-elu-ya di. 3 Uzọ-nbata kwa nke di n'iru ulo uku nke ulo ahu, orú cubit ka ogologo-ya di, n'iru obosara ulo ahu; cubit iri ka obosara-ya di n'iru ulo ahu. 4 O we mere ulo ahu window ufọdu di obosara nime, kpa kwa nkpa n'èzi. 5 O wu-kwa-ra okpukpu-ulo n'akuku mb͕idi ulo ahu buruburu, bú mb͕idi nile nke ulo ahu buruburu, ma nke ulo uku Chineke ahu, ma nke ime-ime-ulo ahu: o me-kwa-ra ulo ntà nke akuku buruburu: 6 Okpukpu-ulo nke dikarisiri ala, cubit ise ka obosara-ya di, okpukpu-ulo nke-etiti kwa, cubit isi ka obosara-ya di, okpukpu-ulo nke-atọ kwa, cubit asa ka obosara-ya di: n'ihi na o tiyere ngwe n'ulo ahu buruburu n'èzí, ka ihe we ghara ibà na mb͕idi ulo ahu. 7 Ulo ahu, mb͕e anēwu ya, eji nkume nke awazuru awazu mb͕e ebutere ya wue ya: anughi kwa otùtù ma-ọbu anyu-ike ma-ọbu ihe-ọlu ọ bula nke ígwè n'ulo ahu, mb͕e anēwu ya. 8 Ọnu-uzọ nke ulo ntà nke akuku nke-etiti di n'akuku aka-nri nke ulo ahu: ha we si n'uzọ-nrigo nke nāga buruburu nārigo n'ulo ntà nke-etiti, si kwa na nke-etiti je rue nke-atọ. 9 O we wue ulo ahu, wusia ya; o we were ibo na akuku osisi cedar kpue ulo ahu. 10 O wue okpukpu-ulo n'aru ulo ahu nile, cubit ise ka idi-elu-ha di: ha we dabere n'ulo ahu n'osisi cedar. 11 Okwu Jehova we biakute Solomon, si, 12 Ulo a nke gi onwe-gi nēwu, ọ buru na i jegharia n'ukpurum nile, ọ buru kwa na i me ihe nile M'kpere n'ikpe, ọ buru kwa na i debe ihe nile M'nyere n'iwu ijeghari nime ha; M'gēme kwa ka okwum guzosie ike n'ebe i nọ, bú nke M'gwara Devid, bú nna-gi. 13 M'gēbi kwa n'etiti umu Israel, M'gaghi-arapu kwa ndim, bú Israel. 14 Solomon we wue ulo ahu, wusia ya. 15 O were ibo osisi cedar wue mb͕idi ulo ahu nime; site n'ala ulo rue mb͕idi nke okpukpu, o were osisi machita ha nime: o were ibo osisi fir machita ala ulo. 16 O were ibo osisi cedar wue ebe di orú cubit n'azu ulo ahu, site n'ala ulo rue mb͕idi: o were ha wuere ya nime, ibu ime-ime-ulo, ibu ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile. 17 Ulo ahu, nke ahu bú, ulo uku Chineke nke di n'iru ya, di ọgu cubit abua n'ogologo. 18 Osisi cedar di kwa n'aru ulo ahu nime, nke apiri ihe otutu, bú afufa-ọhia na okoko-osisi wara awa: ime ulo ahu nile bu osisi cedar; ọ dighi nkume ahuru anya. 19 O dozi-kwa-ra ime-ime-ulo n'etiti ulo ahu nime, itiye ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova n'ebe ahu. 20 Ma n'iru ime-ime-ulo ahu di orú cubit n'ogologo, na orú cubit n'obosara, na orú cubit n'idi-elu-ya; ọ machita ya ọla-edo makarisiri nma: o were kwa osisi cedar machita ebe-ichu-àjà. 21 Solomon we were ọla-edo makarisiri nma machita ulo ahu nime: o me ka iyab͕a ọla-edo gabiga n'iru ime-ime-ulo ahu; ọ machita kwa ya ọla-edo. 22 Ọ machita-kwa-ra ulo ahu nile ọla-edo, rue mb͕e amachitazuru ulo nile: o were kwa ọla-edo machita ebe-ichu-àjà ahu nile bu nke diri ime-ime-ulo ahu. 23 O me-kwa-ra cherubim abua nke osisi manu olive n'ime-ime-ulo ahu, cubit iri ka elu-ha di. 24 Cubit ise ka otù nku cherub di, cubit ise ka nkù nke-ọzọ nke cherub di kwa: site na nsọtu nkù-ya we rue nsọtu nke-ọzọ nke nkù-ya di cubit iri. 25 Cubit iri ka cherub nke-ọzọ di kwa: cherubim abua ahu nwere otù ọtùtù na otù ọpipi. 26 Idi-elu otù cherub di cubit iri, otú a ka cherub nke-ọzọ di kwa. 27 O we tiye cherubim n'etiti ime-ulo: ha we b͕asa nkù cherubim ahu, nkù nke otù we metu mb͕idi, nkù cherub nke-ọzọ nēmetu kwa mb͕idi nke-ọzọ; nkù-ha nēmeturita onwe-ha, nkù na nkù, n'etiti ulo ahu. 28 Ọ machita cherubim ọla-edo. 29 Ọ tu-kwa-ra mb͕idi nile nke ulo ahu buruburu n'eb͕ub͕u nke ihe-ọpipi, bú cherubim na nkwu na okoko-osisi wara awa, n'ime na n'èzí. 30 Ọ machita-kwa-ra ala ulo ahu ọla-edo, n'ime na n'èzí. 31 O me ibo-uzọ osisi manu olive tiye n'ọnu-uzọ ime-ime-ulo ahu: ọfiere-uzọ na awara-uzọ abua bu otù uzọ n'uzọ ise nke mb͕idi. 32 Ibo-uzọ abua ahu bu osisi manu olive; ọ pia n'elu ha ihe-ọpipi, bú cherubim na nkwu na okoko-osisi wara awa, ọ machita ha ọla-edo; o tisa kwa ọla-edo n'aru cherubim, na n'aru nkwu. 33 Otú a ka o me-kwa-ra awara-uzọ abua nke osisi manu olive itiye n'ọnu-uzọ ulo uku Chineke, site n'otù uzọ n'uzọ anọ nke mb͕idi; 34 na ibo-uzọ abua nke osisi fir; ibewa-uzọ abua nke otù ibo-uzọ nāga buruburu, ibewa-uzọ abua nke ibo-uzọ nke-ọzọ nāga kwa buruburu. 35 Ọ pia n'elu ha cherubim na nkwu na okoko-osisi wara awa: ọ were ọla-edo nke emere ka ọ dabà n'elu ihe eb͕uru eb͕ub͕u machita ha. 36 O were akuku nkume awara awa atọ na otù ariri osisi cedar awara awa wue ogige ime-ime. 37 N'arọ nke-anọ ka atọrọ ntọ-ala ulo Jehova, n'ọnwa Ziv. 38 Ma n'arọ nke-iri-na-otù, n'ọnwa Bul, nke bu ọnwa nke-asatọ, ka ewusiri ulo ahu n'ihe-ya nile na n'ikpé-ya nile. O we nọ arọ asa n'iwu ya.

1 Ndi-Eze 7

1 Ma Solomon nọ arọ iri na atọ n'iwu ulo nke aka ya, ọ we wubìe ulo-ya nile. 2 O we wue ulo oké ọhia Lebanon; ọgu cubit ise ka ogologo-ya di, ọgu cubit abua na iri ka obosara-ya di kwa, orú cubit na iri ka idi-elu-ya di, ọ di n'elu akuku anọ nke ogidi osisi cedar, osisi cedar awara awa di kwa n'elu ogidi ahu. 3 Ewere osisi cedar kpuchie ya n'elu, n'elu ọgu ulo ntà nke akuku abua na ise, nke di n'elu ogidi; iri na ise n'otù akuku. 4 Ọnọdu window di kwa n'akuku atọ, ebe nleputa-anya di kwa na ncherita-iru ebe nleputa-anya n'okpukpu atọ. 5 Ọnu-uzọ nile na awara-uzọ nile nwere akuku anọ ra nrata, n'ọnọdu window: ebe nleputa-anya di kwa na ncherita-iru ebe nleputa-anya n'okpukpu atọ. 6 O me-kwa-ra uzọ-nbata nke ogidi; ọgu cubit abua na iri ka ogologo-ya di, orú cubit na iri ka obosara-ya di kwa; uzọ-nbata di kwa n'iru ha; ogidi na nbata-uzọ di kwa n'iru ha. 7 Ọ me-kwa-ra uzọ-nbata nke oche-eze ebe ọ ganēkpe ikpe, bú uzọ-nbata ikpé: ewere kwa osisi cedar kpuchie ya site n'ala ulo rue ala ulo. 8 Ma ulo-ya ebe o nēbi, bú ogige ọzọ nke di nime uzọ-nbata, ọ di ka ọlu a si di. O wu-kwa-ra ulo nye nwa-nwayi Fero, (bú nwayi nke Solomon luru na nwunye, ) dika uzọ-nbata nka. 9 Eji nkume di oké ọnu-ahia wu ndia nile, bú nkume awara awa, dika ọtùtù si di, nkume eji mma-nkwọ kwọ, n'ime na n'èzí, bú site na ntọ-ala rue ndobi-ya, na n'èzí rue ogige uku ahu. 10 Ntọ-ala-ya bu kwa nkume di oké ọnu-ahia, bú nkume uku, nkume di cubit iri, na nkume di cubit asatọ. 11 Nkume nke di oké ọnu-ahia di kwa n'elu, dika ọtùtù nke osisi awara awa si di, na osisi cedar. 12 Ogige uku nke di buruburu nwe-kwa-ra akuku atọ nke nkume awara awa, na otù ariri nke osisi cedar awara awa; ọbuná dika ogige ime-ime ulo Jehova si enwe, na dika uzọ-nbata ulo si enwe. 13 Eze Solomon we ziga si na Taia kuputa Hairam. 14 Nwa nke nwayi di-ya nwuru ka ọ bu, sitere n'ebo Naftali, ma nna-ya bu nwoke Taia, bú ọkpu-ọla; o juputara n'amam-ihe na nghọta na ihe-ọmuma, ije ozi ọ bula n'ọla. O we biakute eze, bú Solomon, je ozi-ya nile. 15 O we kpua ogidi ọla abua, cubit iri na asatọ ka idi-elu otù ogidi di: ogho cubit iri na abua b͕a-kwa-ra ogidi nke-abua buruburu. 16 O me-kwa-ra isi abua nke ọla awuru awu, itiye n'elu ogidi: cubit ise ka idi-elu otù isi di, cubit ise ka idi-elu isi nke-ọzọ di kwa. 17 Ihe-ọkpukpa, bú ihe emere ka ha yie ihe-ọkpukpa, na ihe aturu atu, bú ihe emere ka ha yie iyab͕a, diri isi nke di n'elu ogidi abua; asa diri otù isi, asa di-kwa-ra isi nke-ọzọ. 18 O me ogidi abua ahu; akuku abua dikwasi otù ihe-ọkpukpa buruburu, ikpuchi isi nke di n'elu pomegranate: otú a ka o me-kwa-ra isi nke-ọzọ. 19 Isi nke di n'elu ogidi n'uzọ-nbata ahu bu ihe emere ka ha yie urodi, cubit anọ. 20 Ma isi di kwa n'elu ogidi abua ahu n'elu, na ncherita-iru afọ nke di n'akuku ihe-ọkpukpa: pomegranate di ọgu iri, n'akuku nke dikwasi isi nke-ọzọ buruburu. 21 O guzo ogidi abua ahu n'uzọ-nbata nke ulo uku Chineke: o guzo ogidi aka-nri, kpọ aha-ya Jakin: o guzo ogidi aka-ekpe, kpọ aha-ya Boaz. 22 Ma n'elu ogidi ihe di nke emere ka o yie urodi: ewe luzue ọlu ogidi abua ahu. 23 O me-kwa-ra oké osimiri awuru awu, cubit iri site n'otù ọnu-ya rue ọnu-ya nke-ọzọ, ọ di gburugburu gburugburu, cubit ise ka idi-elu-ya di: eriri nke orú cubit na iri b͕a-kwa-ra ya buruburu. 24 Afufa-ọhia di kwa n'okpuru ọnu-ya buruburu nke nāb͕a ya buruburu, iri di n'otù cubit, nāb͕a oké osimiri ahu buruburu: afufa-ọhia ahu di ariri abua, awuru mb͕e awuru ya. 25 Ọ nēguzo n'elu ehi iri na abua, atọ nēche iru n'Ugwu, atọ nēche iru n'Ọdida-anyanwu, atọ nēche iru na Ndida, atọ nēche iru n'Ọwuwa-anyanwu: oké osimiri ahu we dikwasi ha n'elu, azu-ha nile di kwa nime. 26 Ib͕idi-ya di otù ntù-ọbu-aka; emere ọnu-ya dika anēme ọnu iko, dika okoko urodi: nnù bath ise ka ọ nānagide. 27 Ọ me ihe-ndọkwasi iri nke ọla; cubit anọ ka ogologo otù ihe-ndọkwasi di, cubit anọ ka obosara-ya di kwa, cubit atọ ka idi-elu-ya di kwa. 28 Ma nka bu otú emere ihe-ndọkwasi: ha nwere ihe-njikọ, bú ihe-njikọ n'etiti nkwukọta-ya: 29 ọdum na ehi na cherubim di n'ihe-njikọ nke di n'etiti nkwukọta ahu; ihe-ndọkwasi dikwasi na nkwukọta n'elu: ihe aturu atu nke emere ka o yie ihe-nkwuba di kwa n'okpuru ọdum nile na ehi nile. 30 Ihe-ndọkwasi ọ bula nwere wheel ọla anọ, na axle ọla: ukwu-ya anọ nwere ubu: n'okpuru ite ọsisa-miri ahu ka ubu ahu akpuru akpu di, n'akuku ihe aturu atu ọ bula. 31 Ọnu-ya nime isi-ya na n'elu di otù cubit: ọnu-ya di kwa buruburu, otú emere ihe-ndọkwasi, otù cubit na nkera cubit: ihe-ọpipi dikwasi kwa n'ọnu-ya, ihe-njikọ nile ha nwere akuku anọ ra nrata, ha adighi buruburu. 32 Wheel anọ ahu di n'okpuru ihe-njikọ: aka wheel di n'ihe-ndọkwasi: idi-elu otù wheel di otù cubit na nkera cubit. 33 Otú emere wheel nile di ka esi eme wheel ub͕ọ-ala: aka nile ha, na azu nile ha, na ihe nile nējikọta ha, na etiti nile ha, awuru ha nile awu. 34 Ubu anọ di na nkuku anọ nke ihe-ndọkwasi ọ bula: ubu-ya sitere n'ihe-ndọkwasi ahu. 35 Ihe di gburugburu gburugburu, nke idi-elu-ya di nkera cubit, di n'elu ihe-ndọkwasi ahu: aka-ya nile na ihe-njikọ-ya nile, nke di n'elu ihe-ndọkwasi ahu sitere na ya. 36 O b͕ue eb͕ub͕u cherubim na ọdum na nkwu n'elu mbadamba aka-ya nile, na n'elu ihe-njikọ-ya nile, dika ọnọdu di efu nke ebe ọ bula si di, ha na ihe aturu atu buruburu. 37 Otú a ka o mere ihe-ndọkwasi iri ahu: ha nile nwere otù ọwuwu, na otù ọtùtù, na otù ọpipi. 38 O me kwa ite ọsisa-miri iri nke ọla: ọgu bath abua ka otù ite ọsisa-miri nānagide: cubit anọ ka ite ọsisa-miri ọ bula di: otù ite ọsisa-miri di n'elu ihe-ndọkwasi ọ bula n'ihe-ndọkwasi iri ahu. 39 O tiye ihe-ndọkwasi ahu, ise n'akuku aka-nri ulo ahu, ise n'akuku aka-ekpe ulo ahu: o tiye kwa oké osimiri ahu n'akuku aka-nri ulo ahu n'akuku Iru-anyanwu, na ncherita iru Ndida. 40 Hairam me-kwa-ra ite ọsisa-miri nile, na osekè nile, na ọkwa-nwusa nile. Hairam we jebìe ozi nile nke o jere eze, bú Solomon, n'ulo Jehova: 41 ogidi abua ahu, na ọkwa abua nke isi nke di n'elu ogidi abua; na ihe-ọkpukpa abua ahu ikpuchi ọkwa abua nke isi nke di n'elu ogidi; 42 na nnù pomegranate ahu nke diri ihe-ọkpukpa abua ahu; bú akuku pomegranate abua bayere otù ihe-ọkpukpa, ikpuchi ọkwa abua nke isi nke di n'iru ogidi; 43 na ihe-ndọkwasi iri ahu, na ite ọsisa-miri iri ahu nke di n'elu ihe-ndọkwasi; 44 na otù oké osimiri ahu, na ehi iri na abua ahu nke di n'okpuru oké osimiri; 45 na ite nile, na osekè nile, na ọkwa-nwusa nile: ma ihe ndia nile, nke Hairam mere eze, bú Solomon, n'ulo Jehova, bu ọla nēb͕u maramara. 46 Na buruburu-ala Jọdan ka eze wuru ha, n'ala urọ n'etiti Sukot na Zaretan. 47 Solomon we dọba ihe ahu nile ghara itù ha, n'ihi na ha bara uba nke ukwu: achọputaghi ọtùtù ọla ahu. 48 Solomon me-kwa-ra ihe nile nke di n'ulo Jehova: ebe-ichu-àjà ọla-edo, na table nke achicha iru Chineke di n'elu ya, ọ bu ọla-edo: 49 na ihe-idọba-oriọna, ise n'aka-nri, ise n'aka-ekpe, n'iru ime-ime-ulo ahu, ha bu ọla-edo makarisiri nma; na okoko-osisi nile, na oriọna nile, na nkpa nile, ha bu ọla-edo; 50 na iko nile, na ihe-ikpakepu-ọku nile, na ọkwa-nwusa nile, na ngaji nile, na ihe-igu-ọku nile, ha bu ọla-edo makarisiri nma; na ihe-nkoye-ibo nile, ma nke diri ọnu-uzọ ime-ime ulo ahu, bú ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile, ma nke diri ọnu-uzọ ulo, bú ulo uku Chineke, ha bu ọla-edo. 51 Ewe jezue ozi nile nke eze, bú Solomon, jere n'ulo Jehova. Solomon we webata ihe nile Devid, bú nna-ya, doro nsọ, bú ọla-ọcha, na ọla-edo, na ihe nile, o we tiye ha n'ulo-àkù nke ulo Jehova.

1 Ndi-Eze 8

1 Mb͕e ahu Solomon kpọkọtara ndi-okenye Israel, na ndi-isi nile nke ebo nile ha, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna umu Israel, ibiakute eze, bú Solomon, nime Jerusalem, isi n'obodo Devid, nke ahu bu Zaion, bugota ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova. 2 Ndikom nile nke Israel we kpọkọta onwe-ha biakute eze, bú Solomon, n'ememe, n'ọnwa Etanim, nke ahu bu ọnwa nke-asa. 3 Ndi-okenye nile nke Israel we bia, ndi-nchu-àjà we bulie ib͕e ahu. 4 Ha we bugota ib͕e Jehova, na ulo-ikwū nzute, na ihe nsọ nile nke di n'Ulo-ikwū ahu; ndi-nchu-àjà na ndi Livai we bugota ha. 5 Eze, bú Solomon, na nzukọ nile nke Israel, bú ndi nēzukọta n'ebe ọ nọ, nọyere ya n'iru ib͕e ahu, n'āchu àjà ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, nke anādighi-agu ha ọnu, nke anādighi-aguta kwa ha n'ihi iba-uba-ha. 6 Ndi-nchu-àjà we bubata ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova n'ebe-ya, nime ime-ime-ulo nke ulo ahu, rue ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile, rue n'okpuru nkù cherubim. 7 N'ihi na cherubim nāb͕asa nkù-ha rue ebe ib͕e ahu, cherubim we nēkpuchi ib͕e ahu na nkpa-n'aka-ya abua n'elu. 8 Nkpa-n'aka we di ogologo, ewe hu isi nkpa-n'aka site n'ebe nsọ n'iru ime-ime-ulo ahu; ma adighi-ahu ha n'èzí: ha we di n'ebe ahu, rue ta. 9 Ọ dighi ihe di n'ib͕e ahu, ọ bu nání mbadamba nkume abua nke Moses dọbara n'ebe ahu na Horeb, mb͕e Jehova na umu Israel b͕ara ndu, mb͕e ha siri n'ala Ijipt puta. 10 O rue, mb͕e ndi-nchu-àjà siri n'ebe nsọ puta, na igwe-oji juputara ulo Jehova, 11 ndi-nchu-àjà we ghara inwe ike iguzo ije ozi n'ihi igwe-oji ahu: n'ihi na ebube Jehova juputara ulo Jehova. 12 Mb͕e ahu Solomon siri, Jehova asiwo na O gēbi n'oké ọchichiri. 13 N'ezie ewuworom I ulo obibi, bú ọnọdu guzosiri ike ebe I gēbi rue mb͕e ebighi-ebi. 14 Eze we chigharia iru-ya, gọzie nkpọkọta nile nke Israel: nkpọkọta nile nke Israel nēguzo kwa. 15 Ọ si, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke Israel, bu, Onye were ọnu-Ya gwa Devid, bú nnam, okwu, were kwa aka-Ya mezue ya, si, 16 Site n'ubọchi mb͕e M'mere ka ndim, bú Israel, si n'Ijipt puta, arọputaghm obodo n'ebo nile nke Israel iwu ulo, ka aham we di n'ebe ahu; ma arọputaram Devid ibu onye-isi ndim, bú Israel. 17 O we di n'obi Devid, bú nnam, iwuru aha Jehova, bú Chineke Israel, ulo. 18 Jehova we si Devid, bú nnam, N'ihi na ọ di n'obi-gi iwuru aham ulo, i mere nke-ọma na ọ di n'obi-gi: 19 otú ọ di, gi onwe-gi agaghi-ewu ulo ahu: kama, nwa-gi nwoke nke nēsi n'úkwù-gi puta, onye ahu gēwuru aham ulo. 20 Jehova emewo kwa ka okwu-Ya nke O kwuru guzosie ike; m'we bilie n'ọnọdu Devid, bú nnam, nọkwasi n'oche-eze Israel, dika Jehova kwuru, m'we wuere aha Jehova, bú Chineke Israel, ulo, 21 doro ib͕e ahu ọnọdu n'ebe ahu, bú ib͕e nke ọb͕ub͕a-ndu Jehova di n'ebe ahu, bú ọb͕ub͕a-ndu nke Ya na nna-ayi-hà b͕ara, mb͕e O mere ka ha si n'ala Ijipt puta. 22 Solomon we guzo n'iru ebe-ichu-àjà Jehova n'iru nkpọkọta nile nke Israel, we b͕asa ọbu-aka-ya abua n'ebe elu-igwe di: 23 ọ si, Jehova, bú Chineke Israel, ọ dighi Chineke dika Gi, n'elu-igwe di n'elu, ma-ọbu n'elu uwa di n'okpuru; I nēdebere ndi-orù-Gi ọb͕ub͕a-ndu na ebere, bú ndi were obi-ha nile nējeghari n'iru Gi: 24 I debeworo orù-Gi Devid, bú nnam, ihe I gwara ya: I we were ọnu-Gi kwue, were kwa aka-Gi mezue ya, otú ọ di ta. 25 Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke Israel, debere orù-Gi Devid, bú nnam, okwu nke I gwaworo ya, si, Ọ dighi nwoke ọ bula i nwere agēbipu n'irum n'inọkwasi n'oche-eze Israel; nání ọ buru na umu-gi elezi uzọ-ha anya, ijeghari n'irum dika i jeghariworo n'irum. 26 Ma ub͕u a, Chineke Israel, biko, ka okwu-Gi kwesi ntukwasi-obi, nke I gwara orù-Gi, bú Devid nnam. 27 Ma ọ̀ bu ezie na Chineke gēbi n'elu uwa? le, elu-igwe na elu-igwe nke elu-igwe agaghi-anagide Gi; ulo a nke m'wuworo, ò gēsi kwa aṅa rue inagide Gi? 28 Ma che iru n'ekpere orù-Gi, na n'aririọ-amara-ya, Jehova, bú Chinekem, ige nti iti-nkpu na ekpere orù-Gi nēkpe n'iru Gi ta: 29 ka anya-Gi abua we nāsaghe n'ebe ulo a di abali na ehihie, bú n'ebe ebe ahu di nke I siworo, Aham gādi n'ebe ahu: ige nti ekpere nke orù-Gi gēkpe n'ebe a di. 30 Ge kwa nti aririọ-amara orù-Gi, na nke ndi-Gi, bú Israel, mb͕e ha nēkpe ekpere n'ebe ebe a di: Gi onwe-gi nuru kwa n'ebe obibi-Gi, n'elu-igwe; mb͕e I nuworo, Gi b͕aghara. 31 Ihe ọ bula nke nwoke gēmehie nime ya megide madu-ibe-ya, ewe tukwasi ya iyi ime ka ọ ṅua, iyi ahu we bia n'iru ebe-ichu-àjà-Gi n'ulo a: 32 Gi onwe-gi nuru kwa n'elu-igwe, me kwa, kpe ndi-orù-Gi ikpe, igu onye nēmebi iwu n'onye nēmebi iwu, itukwasi uzọ-ya n'isi-ya; na igu onye ezi omume n'onye ezi omume, inye ya dika ezi omume-ya si di. 33 Mb͕e anētib͕u ndi-Gi, bú Israel, n'iru onye-iro, n'ihi na ha nēmehie megide Gi; ọ buru na ha alaghachikute Gi, kwuputa aha-Gi, kpe ekpere, riọ Gi amara n'ulo a: 34 Gi onwe-gi nuru kwa n'elu-igwe, b͕aghara nmehie ndi-Gi, bú Israel, me ka ha lata n'ala nke I nyere ndi bu nna-ha. 35 Mb͕e eb͕ochiri elu-igwe, mb͕e miri-ozuzo nādighi kwa, n'ihi na ha nēmehie megide Gi; ọ buru na ha ekpe ekpere n'ebe a, kwuputa aha-Gi, si na nmehie-ha laghachi, n'ihi na I nēweda ha n'ala: 36 Gi onwe-gi nuru kwa n'elu-igwe, b͕aghara nmehie ndi-orù-Gi, na nke ndi-Gi, bú Israel, n'ihi na I nēzí ha ezi uzọ nke ha ganēje ije nime ya; Gi me kwa ka miri zokwasi ala-Gi, nke I nyeworo ndi-Gi ibu ihe-nketa. 37 Mb͕e oké unwu gādi n'ala, mb͕e ajọ ọria nke nēfe efe gādi, mb͕e nchakpọ gādi, ma-ọbu ọmuma-ebu, ma-ọbu igurube, ma-ọbu ọbubu; mb͕e onye-iro-ha gānọchigide ha n'agha n'ala nke ọnu-uzọ-ama nile ha; ihe-otiti ọ bula, ọria ọ bula; 38 ekpere ọ bula, aririọ ọ bula, nke gādiri madu ọ bula, ma-ọbu nke gādiri ndi-Gi nile, bú Israel, ndi gāmara, nwoke ọ bula ihe-otiti nke obi-ya, o we b͕asa ọbu-aka-ya abua n'ebe ulo a di: 39 Gi onwe-gi nuru kwa n'elu-igwe, bú ọnọdu obibi-Gi guzosiri ike, b͕aghara, me kwa, nye nwoke ọ bula dika uzọ-ya nile si di, onye I mara obi-ya; (n'ihi na Gi onwe-gi amawo obi umu madu nile, nání Gi; ) 40 ka ha we tua egwu Gi ubọchi nile nke ha onwe-ha nēbi n'elu ala ahu nke I nyere nna-ayi-hà. 41 Ọzọ kwa, ihe bayere onye ala ọzọ, nke ọ bughi na ndi-Gi, bú Israel, ka o sitere, ma o siwo n'ala di anya bia n'ihi aha-Gi; 42 (n'ihi na ha gānu aha uku Gi, na aka-Gi di ike, na ogwe-aka-Gi esetiri eseti; ) mb͕e ọ gābia kwa kpe ekpere n'ulo a; 43 Gi onwe-gi nuru kwa n'elu-igwe, bú ọnọdu obibi-Gi guzosiri ike, me dika ihe nile si di nke onye ala ọzọ ahu nākpọku Gi; ka ndi nile nke uwa we mara aha-Gi, itu egwu Gi, dika ndi-Gi, bú Israel, si eme, na imara na akpọkwasiri aha-Gi n'ulo a nke m'wuworo. 44 Mb͕e ndi-Gi gāpu ibuso onye-iro-ha agha, n'uzọ ọ bula I gēziga ha, ha we kpere Jehova n'uzọ obodo ahu nke I rọputaworo, na n'ebe ulo a di nke m'wuworo aha-Gi: 45 Gi nuru kwa n'elu-igwe ekpere-ha na aririọ-amara-ha, mezie ikpé-ha. 46 Mb͕e ha gēmehie megide Gi, (n'ihi na ọ dighi madu ọ bula nke nādighi-emehie, ) I we wesa ha iwe, rara ha nye n'iru onye-iro-ha, ndi nādọta ha n'agha ewe dọta ha n'agha je n'ala onye-iro, n'ebe di anya ma-ọbu n'ebe di nso; 47 ha we chegharia n'obi-ha n'ala ebe adọtara ha n'agha, we chigharia, riọ Gi amara n'ala ndi nādọta ha n'agha, si, Ayi emehiewo, me ajọ omume, mebie iwu-Gi; 48 ọ buru kwa na ha ewere obi-ha nile, were kwa nkpuru-obi-ha nile, laghachikute Gi n'ala ndi-iro-ha, bú ndi dọtara ha n'agha, ha ewe kpere Gi n'uzọ ala-ha, nke I nyere ndi bu nna-ha, na obodo ahu nke I rọputaworo, na ulo nke m'wuworo aha-Gi: 49 Gi nuru kwa n'elu-igwe, bú ọnọdu obibi-Gi guzosiri ike, ekpere-ha na aririọ-amara-ha, mezie ikpé-ha; 50 Gi b͕aghara kwa ndi-Gi ndi mehieworo megide Gi, na njehie-ha nile nke ha jehieworo megide Gi; Gi nye kwa ha ka enwe obi-ebere n'aru ha n'iru ndi nādọta ha n'agha, ka ha we nwe obi-ebere n'aru ha: 51 n'ihi na ndi-Gi na ihe-nketa-Gi ka ha bu, ndi I mere ka ha si n'ala Ijipt, n'etiti oké ọku ígwè ahu, puta: 52 ka anya-Gi abua we nāsaghe n'aririọ-amara orù-Gi, na n'aririọ-amara ndi-Gi, bú Israel, ige nti ha na nkpọku nile ha nākpọku Gi. 53 N'ihi na Gi onwe-gi kewaputara ha n'etiti ndi nile nke uwa, iburu Gi ihe-nketa, dika I kwuru n'aka Moses, bú orù-Gi, mb͕e I mere ka nna-ayi-hà si n'Ijipt puta, Onye-nwe-ayi, bú Jehova. 54 O rue, mb͕e Solomon kpebìri ekpere a nile na aririọ-amara a nile nye Jehova, na o siri n'iru ebe-ichu-àjà Jehova bilie, site n'ib͕u ikperè-ya abua n'ala, site kwa n'ime ka aka-ya abua b͕asa n'ebe elu-igwe di. 55 O we guzo, were oké olu gọzie nkpọkọta nile nke Israel, si, 56 Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, Onye nyeworo ndi-Ya, bú Israel, izu-ike, dika ihe nile nke O kwuru si di: ọ dighi otù okwu dapuru n'okwu-Ya nile di nma, nke O kwuru n'aka Moses, bú orù-Ya. 57 Ka Jehova, bú Chineke-ayi, nọyere ayi, dika Ọ nọyere nna-ayi-hà: ka Ọ ghara irapu ayi, ka Ọ ghara kwa ib͕anari ayi: 58 ka O we wezuga obi-ayi ka ha biakute Ya, ije ije n'uzọ-Ya nile, na idebe ihe nile O nyere n'iwu, na ukpuru-Ya nile, na ikpé-Ya nile, nke O nyere nna-ayi-hà n'iwu. 59 Ka okwum ndia, nke m'jiri riọ amara n'iru Jehova, di kwa nso Jehova, bú Chineke-ayi, ehihie na abali, ka O we mezie ikpé orù-Ya, na ikpé ndi-Ya, bú Israel, ihe ubọchi n'ubọchi-ya: 60 ka ndi nile nke uwa we mara na Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke; onye ọzọ adighi. 61 Ka obi-unu zu kwa okè n'ebe Jehova, bú Chineke-ayi, nọ, ijeghari n'ukpuru-Ya nile, na idebe ihe nile O nyere n'iwu, otú ọ di ta. 62 Eze, ya na Israel nile, nāchu kwa àjà n'iru Jehova. 63 Solomon we chua ihe àjà nke àjà-udo nke ọ churu nye Jehova, bú orú nnù ehi uzọ abua na nnù iri-na-ise, na orú nnù aturu uzọ iri-na-ise. Eze na umu Israel nile we ra ulo Jehova nye Chineke. 64 N'ubọchi ahu ka eze doro etiti ogige nke di n'iru ulo Jehova nsọ; n'ihi na ọ churu àjà-nsure-ọku na onyinye-inata-iru-ọma na abuba àjà-udo n'ebe ahu: n'ihi na ebe-ichu-àjà ọla nke di n'iru Jehova di ntà kari inagide àjà-nsure-ọku, na onyinye-inata-iru-ọma, na abuba àjà-udo. 65 Solomon we me ememe na mb͕e ahu, ya na Israel nile, nkpọkọta uku, site na nbata Hemat rue miri-iyi Ijipt, n'iru Jehova, bú Chineke-ayi, ubọchi asa na ubọchi asa, bú ubọchi iri na anọ. 66 N'ubọchi nke-asatọ o zilagara ndi Israel, ha we gọzie eze, la n'ulo-ikwū-ha nāṅuri ọṅu, obi di kwa ha nma, n'ihi ezi ihe nile nke Jehova mere Devid, bú orù-Ya, nke O me-kwa-ra Israel, bú ndi-Ya.

1 Ndi-Eze 9

1 O rue, mb͕e Solomon wubìri ulo Jehova, na ulo eze, na ihe nile nke di Solomon ezi nma n'obi nke tọrọ ya utọ ime, 2 na Jehova mere ka Solomon hu Ya anya nke ub͕ò abua, dika O mere ka ọ hu Ya anya na Gibeon. 3 Jehova we si ya, Anuwom ekpere-gi na aririọ-amara-gi, nke i riọworo n'irum: edowom ulo a, nke i wuworo, nsọ, itiye aham n'ebe ahu rue mb͕e ebighi-ebi; anyam abua na obim gādi kwa n'ebe ahu ubọchi nile. 4 Ma gi onwe-gi, ọ buru na i jegharia n'irum, dika Devid, bú nna-gi, jeghariri, n'izu-okè nke obi, na n'izi-ezi, ime dika ihe nile si di nke M'nyeworo gi n'iwu, ọ buru na i debe ukpurum nile na ikpém nile; 5 M'gēme kwa ka oche-eze ala-eze-gi n'isi Israel guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi; dika M'gwara Devid, bú nna-gi, okwu si, Ọ dighi nwoke ọ bula i nwere agēbipu n'inọkwasi n'oche-eze Israel. 6 Ma ọ buru na unu esi n'isom laghachi ma-ọli, unu onwe-unu ma-ọbu umu-unu, unu-we ghara idebe ihe nile M'nyere n'iwu na ukpurum nile nke M'tiyeworo n'iru unu, unu we je fè chi ọzọ òfùfè, kpọ isi ala nye ha: 7 M'gēbipu kwa Israel n'elu ala nka nke M'nyeworo ha; M'gēsi kwa n'irum tupu ulo a, nke M'doworo nsọ nye aham; Israel gāghọ kwa ilu na ihe-àkùkù n'etiti ndi ọzọ nile: 8 ulo a kwa, nke kachasi elu, o gēju onye ọ bula nke nāgabiga ya anya, ọ gāma ọsọ; ha gāsi kwa, N'ìhi gini ka Jehova meworo ala nka na ulo a otú a? 9 Ha gāsi kwa, Ọ bu n'ihi na ha rapuru Jehova, bú Chineke-ha, Onye mere ka ndi bu nna-ha si n'ala Ijipt puta, ha we jide chi ọzọ, kpọ isi ala nye ha, fè ha òfùfè: n'ihi ya ka Jehova meworo ka ihe ọjọ a nile biakwasi ha. 10 O rue, n'ọgwugwu orú arọ, nke Solomon wuru ulo abua nime ha, bú ulo Jehova na ulo eze, 11 (ma Hairam, bú eze Taia, were osisi cedar, were kwa osisi fir, were kwa ọla-edo, yere Solomon aka, dika ihe nile si di nke nātọ ya utọ, ) na eze Solomon nyere Hairam orú obodo n'ala Galili mb͕e ahu. 12 Hairam we si na Taia puta ihu orú obodo ahu nke Solomon nyere ya; ma ha ezighi ezi n'anya-ya. 13 O we si, Gini bu obodo ndia nke i nyeworom, nwa-nnem? Ọ we kpọ ha ala Kabul, rue ta. 14 Hairam we zigara eze ọgu talent ọla-edo isi. 15 Ma nka bu ihe kpatara usu ndi nēfè òfùfè nke eze, bú Solomon, weputara; iwu ulo Jehova, na ulo nke aka ya, na Milo, na mb͕idi Jerusalem, na Hezoa, na Megido, na Gezea. 16 N'ihi na Fero, bú eze Ijipt, rigoro, were Gezea, sure ya n'ọku, b͕ue ndi Kenean ndi bi n'ọbodo ahu, were ya nye nwa-ya nwayi, bú nwunye Solomon, ka ọ buru ihe idu-ulo. 17 Solomon we wue Gezea, na Bet-horon di n'okpuru, 18 na Bealat, na Tema n'ọzara, n'ala-ya, 19 na obodo nile nke nchikọbata-ihe nke Solomon nwere, na obodo nile nke ub͕ọ-ala-ya, na obodo nile nke ndi-inyinya-ya, na ihe di Solomon ezi nma n'obi, bú nke di ya ezi nma n'obi iwu na Jerusalem, na nime Lebanon, na n'ala nile ọ nāchi. 20 Ma ndi nile fọduru n'etiti ndi-Amorait, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus, ndi nēsiteghi n'umu Israel; 21 umu-ha ndi fọduru inọchi ha n'ala, ndi umu Israel nāpughi iwezuga ka ebibie ha, Solomon we si nime ha weputa usu ndi nēfè òfùfè, bú ndi-orù, rue ta. 22 Ma ọ dighi orù Solomon mere site n'umu Israel: kama ndi ahu bu ndikom agha, na ndi-orù-ya, na ndi-isi-ya, na ndi-ọchi-agha-ya, na ndi-isi ub͕ọ-ala-ya na ndi-inyinya-ya. 23 Ndia bu ndi-isi nke ndi ahu edoro ndi-isi, ndi bu ndi-isi n'ozi anējere Solomon, nnù madu na ọgu asa na iri, ndi nwere ike n'aru ndi nālu ọlu n'ije-ozi ahu. 24 Otú ọ di, nwa-nwayi Fero siri n'obodo Devid rigorue ulo-ya nke Solomon wuru nye ya: mb͕e ahu ka o wuru Milo. 25 Ub͕ò atọ n'arọ ka Solomon surere àjà-nsure-ọku na àjà-udo nye Jehova n'elu ebe-ichu-àjà nke o wuru, o we sure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ tiyere ya n'elu ebe-ichu-àjà nke di n'iru Jehova. O we wuzue ulo ahu. 26 Eze, bú Solomon, me-kwa-ra ub͕ọ n'Ezion-geba, nke di n'akuku Ilot, n'usọ Oké Osimiri Uhie, n'ala Edom. 27 Hairam we zìe ndi-orù-ya n'ub͕ọ-ya, bú ndi-ub͕ọ ndi mara oké osimiri, ha na ndi-orù Solomon. 28 Ha we biarue Ofia, si n'ebe ahu weta ọla-edo, nnù talent na orú talent, wetara eze, bú Solomon.

1 Ndi-Eze 10

1 Eze-nwayi Sheba we nānu akukọ Solomon bayere aha Jehova, o we bia iwere ilu di iche iche nwa ya. 2 Ọ biarue Jerusalem, ya na usu di ọtutu nke-uku, camel nēbu uda di iche iche, na ọla-edo bara uba nke-uku, na nkume di oké ọnu-ahia: o we biakute Solomon, gwa ya okwu nile nke di ya n'obi. 3 Solomon we gosi ya okwu-ya nile: ọ dighi okwu ọ bula ezonariri eze nke ọ nēgosighi ya. 4 Eze-nwayi Sheba we hu amam-ihe nile nke Solomon, na ulo nke o wuru, 5 na ihe-oriri nke table-ya, na nnọdu nke ndi-orù-ya, na nguzo nke ndi nējere ya ozi, na uwe-ha, na ndi-obu-ihe-ọṅuṅu-ya, na àjà-nsure-ọku-ya nke ọ nēsure n'ulo Jehova; mọ adighi kwa nime ya ọzọ. 6 O we si eze, Ezi-okwu ka okwu ahu bu nke m'nuru n'alam bayere okwu-gi nile, baye-kwa-ra amam-ihe-gi. 7 Ma ekweghm okwu ahu, rue mb͕e m'biara, anyam abua we hu ya: ma, le, egosighm nkera-ya: i tukwasiwo amam-ihe na idi-nma n'akukọ nke m'nuru. 8 Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndikom-i bu, ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi-orù-gi ndia bu, ndi nēguzo n'iru gi mb͕e nile, ndi nānu amam-ihe-gi. 9 Ka Jehova, bú Chineke-gi, buru onye agọziri agọzi, Onye ihe-gi tọrọ Ya utọ, itiyekwasi gi n'oche-eze Israel: ọ bu n'ihi na Jehova huru Israel n'anya rue mb͕e ebighi-ebi ka O doro gi eze, ime ihe ekpere n'ikpe na ezi omume. 10 O nye eze ọgu talent ọla-edo isi, na uda di iche iche bara uba nke-uku, na nkume di oké ọnu-ahia: ọ dighi uda biara ọzọ nke di ka uda ahu n'iba-uba, bú nke eze-nwayi Sheba nyere eze, bú Solomon. 11 Ọzọ kwa, ub͕ọ Hairam, nke siri n'Ofia bute ọla-edo, ha siri n'Ofia bubata osisi almug bara uba nke-uku, na nkume di oké ọnu-ahia. 12 Eze we were osisi almug ahu mere ulo Jehova, me-kwa-ra ulo eze, ihe-ndabere, ọ were kwa ha mere ndi nābù abù ubọ-akwara na une: osisi almug di otú a abiaghi, ahughi kwa ha, rue ta. 13 Eze, bú Solomon, nye-kwa-ra eze-nwayi Sheba ihe nile nātọ ya utọ, ihe ọ bula ọ riọrọ, nāgughi ihe o nyere ya dika aka eze, bú Solomon, si di. O we chigharia la n'ala-ya, ya onwe-ya na ndi-orù-ya. 14 Ma ọtùtù ọla-edo nke biakutere Solomon n'otù arọ di nnù talent ọla-edo na ọgu iri-na-atọ na isi, 15 nāgughi ihe ndikom ndi nējeghari izu ahia wetara, na ọzuzu-ahia nke ndi nāzu ahia, na ọla-edo nke eze nile nke ndi gwara ọgwa, na ọla-edo nke ndi nāchi ala. 16 Eze, bú Solomon, we me ọgu ọta uku iri, ha bu ọla-edo etisara etisa: nnù shekel ọla-edo na ọgu iri bara n'otù ọta uku. 17 O me-kwa-ra ọgu ọta iri-na-ise, ha bu ọla-edo etisara etisa; pound ọla-edo atọ bara n'otù ọta: eze we tiye ha n'ulo oké ọhia Lebanon. 18 Eze me-kwa-ra oké oche-eze ọdu, machita ya ọla-edo anuchara anucha. 19 Oche-eze ahu nwere ihe-nrigo isi, oche-eze ahu nwe-kwa-ra elu di buruburu n'azu ya: aka di kwa n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ n'ebe ọnọdu-ya, ọdum abua nēguzo kwa n'akuku aka ahu. 20 Ọdum iri na abua we nēguzo n'ebe ahu n'elu ihe-nrigo isi ahu n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ: emeghi ya otú a nye ala-eze ọ bula. 21 Ihe nile Solomon nwere, bú nke eji aṅu ihe, bu ọla-edo, ihe nile nke ulo oké ọhia Lebanon bu kwa ọla-edo makarisiri nma: ọ dighi nke bu ọla-ọcha; agughi ya n'ihe ọ bula n'ubọchi Solomon. 22 N'ihi na eze nwere ub͕ọ Tashish n'oké osimiri tiyere ub͕ọ Hairam: otù ub͕ò n'arọ atọ ka ub͕ọ Tashish nābia, nēbute ọla-edo, na ọla-ọcha, na ọdu, na enwe, na ekwuru-ulo. 23 Eze, bú Solomon, we di uku kari eze nile nke uwa n'àkù na n'amam-ihe. 24 Uwa nile we nāchọ iru Solomon, inu amam-ihe-ya, nke Chineke tiyere n'obi-ya. 25 Ndi ahu nēbute kwa, nwoke ọ bula onyinye-inata-iru-ọma-ya, ihe ọla-ọcha, na ihe ọla-edo, na uwe, na ihe-ekike-agha, na uda di iche iche, na inyinya, na inyinya mule, ihe anēnye n'arọ n'arọ-ya. 26 Solomon we chikọta ub͕ọ-ala na ndi-inyinya: o we nwe nnù ub͕ọ-ala atọ na ọgu iri, na orú nnù ndi-inyinya na nnù iri, ọ we do ha n'obodo ub͕ọ-ala, na n'ebe eze nọ na Jerusalem. 27 Eze we me ọla-ọcha ka ọ di ka nkume na Jerusalem, ọ me-kwa-ra osisi cedar ka ha di ka osisi sycomore nke di n'ebe di ala n'uba. 28 Anēme kwa ka inyinya Solomon nwere si n'Ijipt puta; n'usu ka ndi-ahia eze nānara ha, otù usu n'ọnu-ahia-ya. 29 Otù ub͕ọ-ala we rigota si n'Ijipt puta na nnù shekel ọla-ọcha na ọgu iri, na otù inyinya n'ọgu shekel asa na iri: otú a ka ha nēweputara eze nile nke ndi Het, nēweputa-kwa-ra ndi-eze Siria, site n'aka-ha.

1 Ndi-Eze 11

1 Ma eze, bú Solomon, huru ọtutu ndinyom ala ọzọ n'anya, tiyere nwa-nwayi Fero, ndinyom Moab, ndinyom Amon, ndinyom Edom, ndinyom Zaidon, ndinyom Het; 2 bú ndi sitere na mba ndi Jehova siri umu Israel, Unu abala n'etiti ha, ndi ahu aba-kwa-la n'etiti unu: n'ezie ha gēwezuga obi-unu ka o so chi nile ha: ndi ahu ka Solomon rapara n'ihu-n'anya. 3 O we nwe nnù ndinyom na ọgu iri-na-ise, bú umu ndi-isi, na ọgu ndi-iko-nwayi iri-na-ise: ndinyom-ya we wezuga obi-ya. 4 O rue, na mb͕e agadi Solomon, na ndinyom-ya wezugara obi-ya ka o so chi ọzọ: obi-ya ezughi kwa okè n'ebe Jehova, bú Chineke-ya, nọ, dika obi Devid, bú nna-ya. 5 Solomon we jeso Ashtoret, bú chi ndi Zaidon, jeso kwa Milkom, bú ihe-árú ndi Amon. 6 Solomon we me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, o jesozughi kwa Jehova, dika Devid, bú nna-ya, mere. 7 Mb͕e ahu Solomon wubere ebe di elu nye Kemosh, bú ihe-árú Moab, n'ugwu nke di n'iru Jerusalem, nye kwa Molek, bú ihe-árú umu Amon. 8 Otú a ka o me-kwa-ra ndinyom-ya nile, bú ndi ala ọzọ, ndi nēsure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, nāchu-kwa-ra chi nile ha àjà. 9 Jehova we wesa Solomon iwe, n'ihi na ewezugara obi-ya n'ebe Jehova nọ, bú Chineke Israel, Onye mere ka ọ hu Ya anya ub͕ò abua, 10 Onye nye-kwa-ra ya iwu bayere ihe a, ka ọ ghara ijeso chi ọzọ: ma o debeghi ihe ahu nke Jehova nyere n'iwu. 11 Jehova we si Solomon, N'ihi na nka di n'aka-gi, i we ghara idebe ọb͕ub͕a-ndum na ukpurum nile, nke M'nyeworo gi n'iwu, aghaghm idọwapu ala-eze n'aru gi, nye orù-gi. 12 Ọ bu nání na ọ bughi n'ubọchi-gi ka M'gēme ya, n'ihi Devid, bú nna-gi: ọ bu n'aka nwa-gi ka M'gādọwapu ya. 13 Otú ọ di, ọ bughi ala-eze-gi nile ka M'gādọwapu; otù ebo ka M'gēnye nwa-gi, n'ihi Devid, bú orùm, na n'ihi Jerusalem, nke M'rọputaworo. 14 Jehova we me ka onye-nmegide biliere Solomon, bú Hedad, onye Edom: na nkpuru eze n'Edom ka o sitere. 15 O rue, mb͕e Devid nọ n'Edom, mb͕e Joab, bú onye-isi usu-ndi-agha, rigoro ilì ndi eb͕uru eb͕u, na o tib͕uru nwoke ọ bula n'Edom; 16 (n'ihi na ọnwa isi ka Joab na Israel nile nọduru n'ebe ahu, rue mb͕e o bipusiri nwoke ọ bula n'Edom; ) 17 Hedad we b͕alaga, ya onwe-ya na ndikom Edom ufọdu n'etiti ndi-orù nna-ya tiyere ya, ibà n'Ijipt; ma Hedad bu nwa-okoro ntà. 18 Ha we si na Midian bilie, biarue Peran: ha we si na Peran chiri ndikom tiyere onwe-ha, bata n'Ijipt, biakute Fero, bú eze Ijipt; o we nye ya ulo, si ka enye ya nri, o nye-kwa-ra ya ala. 19 Hedad we huta amara n'iru Fero nke-uku, o we nye ya nwa-nne nwunye-ya na nwunye, bú nwa-nne Tahpenes nwunye eze. 20 Nwa-nne Tahpenes we muara ya Genubat, bú nwa-ya nwoke, onye Tahpenes mere ka ọ rapu ara n'etiti ulo Fero: Genubat we nọ n'ulo Fero n'etiti umu-ndikom Fero. 21 Ma Hedad nuru n'Ijipt na Devid soro nna-ya-hà dina n'ọnwu, na Joab, bú onye-isi usu-ndi-agha, anwuwo kwa, Hedad we si Fero, Zilagam, ka m'we la n'alam. 22 Fero we si ya, Ma gini nākọ gi onwe-gi n'ebe m'nọ, na, le, i nācho ila n'ala-gi? Ọ si, Ọ dighi ihe kọrọm: otú ọ di, zilagam nọ̄. 23 Chineke we me ka onye-nmegide ọzọ biliere ya, bú Rezon nwa Eliada, onye b͕anariri Hedadeza eze Zoba, bú onye-nwe-ya: 24 ọ chikọta ndikom n'ebe ọ nọ, ghọ onye-isi usu ndi nāpunara madu ihe, mb͕e Devid buru ndi Zoba: ha we jerue Damaskọs, biri nime ya, buru eze na Damaskọs. 25 Ọ we ghọrọ Israel onye-nmegide ubọchi nile nke Solomon, tiyere ihe ọjọ nke Hedad mere: ike Israel we gwusia ya, o we buru eze Siria. 26 Ma Jeroboam nwa Nebat, onye Efrata nke Zerida, bu orù Solomon nwere, aha nne-ya bu Zerua, nwayi di-ya nwuru, o weli-kwa-ra aka-ya megide eze. 27 Ma nka bu ihe kpatara o ji welie aka-ya megide eze: Solomon wuru Milo, mechie ntipú obodo Devid, bú nna-ya. 28 Nwoke ahu, bú Jeroboam, bu dike nke bu dìnkpà: Solomon we hu nwa-okorọbia ahu, na onye nēje ozi nke-ọma ka ọ bu, o we me ya ka ọ buru onye-nlekọta ibū nile nke ulo Josef. 29 O rue, na mb͕e ahu, na Jeroboam siri na Jerusalem pua, onye-amuma, bú Ahaija, bú onye Shailo, we chọta ya n'uzọ; ma Ahaija nēwere uwe ọhu yikwasi n'aru-ya; ha abua nọ kwa iche, nání ha, n'ọhia. 30 Ahaija we jide uwe ọhu ahu nke di n'aru ya, dọwa ya na ndọwa iri na abua. 31 Ọ si Jeroboam, Chiri n'onwe-gi ndọwa iri: n'ihi na otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Le, M'nādọwapu ala-eze a n'aka Solomon, M'gēnye kwa gi ebo iri: 32 (ma ọ gēnwe otù ebo ahu, n'ihi orùm, bú Devid, na n'ihi Jerusalem, bú obodo nke M'rọputaworo n'ebo nile nke Israel: ) 33 n'ihi na ha arapuwom, kpọ isi ala nye Ashtoret, bú chi ndi Zaidon, nye kwa Kemosh, bú chi Moab, nye kwa Milkom, bú chi umu Amon; ha ejeghi kwa ije n'uzọm nile, ime ihe ziri ezi n'anyam, na idebe ukpurum nile na ikpém nile, dika Devid, bú nna-ya, mere. 34 Ma M'gaghi-ewepu ala-eze nile n'aka-ya: kama onye-isi ka M'gēdo ya ubọchi nile nke ndu-ya, n'ihi Devid, bú orùm, onye M'rọputara, n'ihi na ọ debere ihe nile M'nyere n'iwu na ukpurum nile: 35 ma M'gēwepu ala-eze n'aka nwa-ya, were ya nye gi, bú ebo iri. 36 Ma nwa-ya ka M'gēnye otù ebo, ka Devid, bú orùm, we nwe oriọna ubọchi nile n'irum na Jerusalem, bú obodo nke M'rọputaworo Onwem itiye aham n'ebe ahu. 37 Ma gi ka M'gēwere, i gābu kwa eze n'ihe nile nke nkpuru-obi-gi nāchọsi ike, i gābu kwa eze Israel. 38 O gēru kwa, ọ buru na i nu ihe nile M'gēnye gi n'iwu, ọ buru kwa na i je ije n'uzọm nile, me ihe ziri ezi n'anyam, idebe ukpurum nile na ihe nile M'nyere n'iwu, dika Devid, bú orùm, mere; na M'gānọyere gi, wu-kwa-ra gi ulo kwesiri ntukwasi-obi, dika M'wuru Devid, M'gēnye kwa gi Israel. 39 M'gēweda kwa nkpuru Devid n'ihi nka, ma ọ bughi ubọchi nile. 40 Solomon we chọ ime ka Jeroboam nwua: Jeroboam we bilie, b͕alaga n'Ijipt jekuru Shaishak, bú eze Ijipt, ọ we nọ n'Ijipt rue ọnwu Solomon. 41 Ma okwu Solomon nile nke fọduru, na ihe nile O mere, na amam-ihe-ya, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ okwu Solomon? 42 Ma ubọchi nile Solomon bu eze Israel nile nime Jerusalem di ọgu arọ abua. 43 Solomon we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'obodo Devid, bú nna-ya: Rehoboam, bú nwa-ya, we buru eze n'ọnọdu ya.

1 Ndi-Eze 12

1 Rehoboam we jerue Shekem: n'ihi na Shekem ka Israel nile biaruru, ime ya eze. 2 O rue, mb͕e Jeroboam nwa Nebat nuru ya, (ma onye ahu nānọ n'Ijipt rue mb͕e ahu, ebe o siri n'iru Solomon, bú eze, b͕alaga, Jeroboam we biri n'Ijipt, 3 ha we ziga, kpọ ya; ) na Jeroboam na nkpọkọta Israel nile biara, we gwa Rehoboam okwu, si, 4 Nna-gi mere yoke-ayi ka o sie ike: ma ub͕u a gi onwe-gi me ka ọ di nfe kari, bú òfùfè siri ike nke nna-gi, na yoke-ya di arọ́ nke ọ tukwasiri ayi, ayi gēfè kwa gi òfùfè. 5 Ọ si ha, Lanu rue ubọchi atọ ọzọ, laghachikutekwam. Ndi Israel we la. 6 Eze, bú Rehoboam, we me ka ndi-okenye dua ya ọdu, bú ndi nēguzo n'iru Solomon, bú nna-ya, mb͕e ọ nọ na ndu, si, Ùnu onwe-unu si aṅa nādu ọdu iweghachiri ndi nka okwu? 7 Ha we gwa ya okwu, si, Ọ buru na i ghọrọ ndi nka orù ta, we fè ha òfùfè, za ha, gwa ha okwu di nma, ha gāghọ-kwa-ra gi orù ubọchi nile. 8 Ma ọ rapuru idu-ọdu nke ndi-okenye, nke ha nādu ya, o me ka umu-okorọbia dua ya ọdu, bú ndi ya na ha tokọzuru okè, ndi nēguzo n'iru ya. 9 Ọ si ha, Gini ka unu onwe-unu nādu ọdu, ka ayi we weghachiri ndi nka okwu, bú ndi gwaworom okwu, si, Me ka ọ di nfe kari, bú yoke nke nna-gi tukwasiri ayi? 10 Umu-okorọbia ndi ya na ha tokọzuru okè we gwa ya okwu, si, Otú a ka i gāsi ndi nka, ndi gwara gi okwu, si, Nna-gi mere yoke-ayi ka ọ di arọ́, ma gi onwe-gi me ka ọ di ayi nfe kari; otú a ka i gāgwa ha, si, Nkpisi-aka nke-ntà nkem di okpotokpo kari úkwù nnam. 11 Ma ub͕u a nnam boro unu yoke di arọ́, ma mu onwem gātukwasi ihe na yoke-unu: nnam were utari dọ unu aka na nti, ma mu onwem gēwere akpi dọ unu aka na nti. 12 Jeroboam na ndi Israel nile we biakute Rehoboam n'ubọchi nke-atọ, dika eze kwuru, si, Laghachikutem n'ubọchi nke-atọ. 13 Eze we za ndi ahu okwu ike, rapu idu-ọdu nke ndi-okenye, nke ha nādu ya; 14 o we gwa ha okwu dika idu-ọdu nke umu-okorọbia si di, si, Nnam mere yoke-unu ka ọ di arọ́, ma mu onwem gātukwasi ihe na yoke-unu: nnam were utari dọ unu aka na nti, ma mu onwem gēwere akpi dọ unu aka na nti. 15 Eze we ghara ige ndi Israel nti; n'ihi na nchighari nka sitere n'aka Jehova, ka O we me ka okwu-Ya guzosie ike, bú nke Jehova gwara Jeroboam nwa Nebat site n'aka Ahaija onye Shailo. 16 Israel nile we hu na eze egeghi ha nti, ndi Israel we weghachiri eze okwu, si, Òkè gini ka ayi nwere nime Devid? ọ dighi kwa ihe-nketa di nime nwa Jese: lanu n'ulo-ikwū-unu, Israel: ub͕u a le ulo-gi, Devid. Israel we la n'ulo-ikwū-ha. 17 Ma umu Israel ndi bi n'obodo nile nke Juda, Rehoboam we buru eze-ha. 18 Eze, bú Rehoboam, we ziga Adoram, onye bu onye-isi usu ndi nēfè òfùfè; Israel nile we were nkume tub͕ue ya, o we nwua. Eze, bú Rehoboam, we b͕a onwe-ya ume irigo n'ub͕ọ-ala-ya, ib͕alaga na Jerusalem. 19 Israel we jehie megide ulo Devid, rue ta. 20 O rue, mb͕e Israel nile nuru na Jeroboam alatawo, ha we zìe kpọ ya ibia na nzukọ-ha, ha we me ya eze Israel nile: ọ dighi ebo ọ bula soro ulo Devid, ma-ọbughi ebo Juda, nání ya. 21 Rehoboam we biarue Jerusalem, kpọkọta ulo Juda nile, na ebo Benjamin, orú nnù ndikom orú uzọ na abua na nnù iri, bú ndi arọputara arọputa, ndi nēbu agha, ibuso ulo Israel agha, iweghachiri Rehoboam nwa Solomon ala-eze. 22 Okwu Chineke we rue Shemaia nti, bú onye nke Chineke, si, 23 Gwa Rehoboam nwa Solomon, bú eze Juda, gwa kwa ulo nile nke Juda na Benjamin, gwa kwa ndi Israel fọduru, okwu, si, 24 Otú a ka Jehova siri, Unu arigola, unu ebuso-kwa-la umu-nne-unu, bú umu Israel, agha: laghachinu, nwoke ọ bula n'ulo-ya; n'ihi na n'ebe M'nọ ka ihe a siteworo. Ha we nu okwu Jehova, laghachi azu n'ulo-ha, dika okwu Jehova si di. 25 Jeroboam we wue Shekem n'ugwu Efraim, biri n'ebe ahu; o si n'ebe ahu pua, wue Penuel. 26 Jeroboam we si n'obi-ya, Ub͕u a ka ala-eze gālaghachikuru ulo Devid: 27 ọ buru na ndi nka arigo ichu àjà n'ulo Jehova na Jerusalem, obi ndi nka gālaghachikuru kwa onye-nwe-ha, bú Rehoboam eze Juda; ha gēb͕ukwam, laghachikuru Rehoboam, bú eze Juda. 28 Eze we me ka adua ya ọdu, o we me umu-ehi abua nke ọla-edo; ọ si ha, Unu arigozuwo Jerusalem; le chi-gi, Israel, ndi mere ka i si n'ala Ijipt rigoputa. 29 Ọ dọba otù nime Bet-el, tiye nke-ọzọ nime Dan. 30 Ihe a we ghọ nmehie: ndi Israel we je n'iru otù nime ha, rue Dan. 31 O me ulo nke ebe di elu, me kwa ndi-nchu-àjà sitere n'ọnu-ọgugu ndi Israel nile, ndi nēsiteghi n'umu Livai. 32 Jeroboam we me ememe n'ọnwa nke-asatọ, n'ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa ahu, dika ememe nke di na Juda, o we rigorue ebe-ichu-àjà ahu; otú a ka o mere na Bet-el, ichuru umu-ehi ahu, bú nke o mere, àjà: o guzo na Bet-el ndi-nchu-àjà nke ebe di elu nke o mere. 33 Ọ rigorue ebe-ichu-àjà nke o mere na Bet-el n'ubọchi nke-iri-na-ise n'ọnwa nke-asatọ, bú n'ọnwa nke ọ chèputara n'obi-ya: o we mere umu Israel ememe, rigorue ebe-ichu-àjà isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.

1 Ndi-Eze 13

1 Ma, le, onye nke Chineke siri na Juda bia n'okwu Jehova rue Bet-el: ma Jeroboam nēguzo n'akuku ebe-ichu-àjà isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ. 2 O we kpọ òkù megide ebe-ichu-àjà ahu n'okwu Jehova, si, Ebe-ichu-àjà, ebe-ichu-àjà, otú a ka Jehova siri: Le, agāmuru ulo Devid otù nwa-nwoke, Josaia bu aha-ya; ọ gāchu kwa n'elu gi ndi-nchu-àjà nke ebe di elu ndi nēsure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu gi, ọkpukpu madu ka ha gēsure kwa ọku n'elu gi. 3 O nye-kwa-ra ihe-iriba-ama n'ubọchi ahu, si, Nka bu ihe-iriba-ama ahu nke Jehova kwuworo: Le, agāb͕awa ebe-ichu-àjà nka, wusi kwa ntu nke di n'elu ya. 4 O rue, mb͕e eze nuru okwu onye nke Chineke ahu, nke ọ kpọrọ megide ebe-ichu-àjà nime Bet-el, na Jeroboam siri n'ebe-ichu-àjà setipu aka-ya, si, Jidenu ya. Aka-ya, nke o setiri imegide ya, we kpọnwua, ọ pughi kwa iseghachi ya n'aru ya. 5 Ab͕awa-kwa-ra ebe-ichu-àjà ahu, ewe si n'ebe-ichu-àjà wusi ntu, dika ihe-iriba-ama si di nke onye nke Chineke nyere n'okwu Jehova. 6 Eze we za, si onye nke Chineke, Biko, chọ ime ka iru Jehova, bú Chineke-gi, dajua, gi kpe kwa ekpere bayerem, ka akam we laghachikutem. Onye nke Chineke ahu we chọ ka iru Jehova dajua, aka eze we laghachikuru ya, we di ka ọ di na mbu. 7 Eze we si onye nke Chineke ahu, Sorom ba n'ulo, b͕a onwe-gi ume, m'gēnye kwa gi onyinye. 8 Onye nke Chineke ahu we si eze, Ọ buru na i nyem nkera ulo-gi, m'gaghi-esoro gi ba, m'gaghi-eri kwa nri, m'gaghi-aṅu kwa miri n'ebe a: 9 n'ihi na otú a ka enyerem iwu n'okwu Jehova, si, Erila nri, aṅu-kwa-la miri, alaghachi-kwa-la n'uzọ i siri je. 10 O we la n'uzọ ọzọ, ọ laghachighi kwa n'uzọ o siri biaru Bet-el. 11 Ma otù onye-amuma, bú agadi, bi na Bet-el; nwa-ya we bia, kọrọ ya akukọ omume nile nke onye nke Chineke mere ubọchi ahu na Bet-el: okwu nile ọ gwara eze, ha we kọrọ nna-ha akukọ okwu ahu. 12 Nna-ha we gwa ha okwu, si, Òle nke bu uzọ o jere? Ma umu-ya ndikom ahuwo uzọ nke onye nke Chineke ahu jere, bú onye siri na Juda bia. 13 O we si umu-ya, Jikwaranum inyinya-ibu. Ha we jikwara ya inyinya-ibu: ọ nọkwasi n'elu ya. 14 O we jeso onye nke Chineke ahu n'azu, chọta ya ka ọ nānọdu n'okpuru osisi terebinth: ọ si ya, Ọ̀ bu gi onwe-gi bu onye Chineke ahu nke siri na Juda bia? Ọ si, Ọ bu mu onwem. 15 Ọ si ya, Sorom je n'ulo, ri kwa nri. 16 Ọ si, Apughm isoro gi laghachi, ma-ọbu isoro gi ba n'ulo: m'gaghi-esoro kwa gi ri nri ma-ọbu iṅu miri n'ebe a: 17 n'ihi na okwu rurum nti n'okwu Jehova, si, Erila nri, aṅu-kwa-la miri, n'ebe ahu, alaghachi-kwa-la ila n'uzọ ahu i jere nime ya. 18 Ọ si ya, Mu onwem bu kwa onye-amuma dika gi; mọ-ozi we gwam okwu n'okwu Jehova, si, Me ka o soro gi lata n'ulo-gi, ka o we rie nri ṅu kwa miri. Ma ọ gwara ya okwu-ugha. 19 O we soro ya laghachi, rie nri n'ulo-ya, ṅu kwa miri. 20 O rue, mb͕e ha abua nānọdu nēri ihe na table, na okwu Jehova ruru onye-amuma ahu nti, bú onye mere ka ọ laghachi: 21 ọ kpọ onye nke Chineke ahu òkù, bú onye siri na Juda bia, si, Otú a ka Jehova siri, N'ihi na i nupuwo isi n'okwu-ọnu Jehova, i we ghara idebe ihe enyere n'iwu, nke Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi n'iwu, 22 i we laghachi, rie nri, ṅua miri, n'ebe nke Ọ gwara gi okwu, si, Erila nri, aṅu-kwa-la miri; ozu-gi agaghi-abiaru ílì nna-gi-hà. 23 O rue, mb͕e o risiri nri, mb͕e ọ ṅusi-kwa-ra ihe-ọṅuṅu, na o were inyinya-ibu jikwara ya, bú onye-amuma ahu nke o mere ka ọ laghachi. 24 Ọ we la, ọdum we huta ya n'uzọ, me ka ọ nwua: ewe tupu ozu-ya n'uzọ, inyinya-ibu-ya nēguzo kwa n'akuku ya; ọdum ahu nēguzo kwa n'akuku ozu ahu. 25 Ma, le, ndikom nāgabiga, ha we hu ozu, ka atupuru ya n'uzọ, hu kwa ọdum, ka o nēguzo n'akuku ozu ahu: ha we bia, kwue ya n'obodo nke onye-amuma ahu, bú agadi, nēbi nime ya. 26 Onye-amuma ahu nke mere ka o si n'uzọ laghachi we nu ya, ọ si, Onye nke Chineke ahu ka ọ bu, bú onye nupuru isi n'okwu-ọnu Jehova: Jehova we were ya nye ọdum, o we dọb͕ue ya, me ka ọ nwua, dika okwu Jehova si di, nke Ọ gwara ya. 27 O we gwa umu-ya okwu, si, Jikwaranum inyinya-ibu. Ha we jikwa ya. 28 O je chọta ozu-ya, ka atupuru ya n'uzọ, na inyinya-ibu na ọdum, ka ha nēguzo n'akuku ozu ahu: ọdum erighi ozu ahu, ọ dọb͕ughi kwa inyinya-ibu ahu. 29 Onye-amuma ahu we bulie ozu onye nke Chineke ahu, dọba ya n'elu inyinya-ibu ahu, bughachi ya: ọ biarue obodo onye-amuma ahu, bú agadi, iti aka n'obi, na ilì ya. 30 Ọ dọba ozu-ya n'ílì-ya; ha we tiere ya aka n'obi, si, Ewó, nwa-nnem! 31 O rue, mb͕e o lìsiri ya na ọ gwara umu-ya okwu, si, Mb͕e m'nwuru, lì-kwa-num n'ílì nke elìri onye nke Chineke; dọba ọkpukpum n'akuku ọkpukpu-ya. 32 N'ihi na okwu ahu aghaghi irè, bú nke ọ kpọrọ òkù n'okwu Jehova megide ebe-ichu-àjà nke di na Bet-el, megide kwa ulo nile nke ebe di elu nke di n'obodo nile nke Sameria. 33 Mb͕e ihe a gasiri, Jeroboam esighi n'uzọ ọjọ ya laghachi, ma o me-kwa-ra ndi-nchu-àjà nke ebe di elu ọzọ site n'ọnu-ọgugu nile nke ndi Israel: onye ihe-ya nātọ ya utọ, o mejue ya aka, o we ghọ otù nime ndi-nchu-àjà nke ebe di elu. 34 Ihe a we ghọrọ ulo Jeroboam nmehie, ọbuná izopu ya, na ikpochapu ya n'elu uwa.

1 Ndi-Eze 14

1 Na mb͕e ahu Abaija nwa Jeroboam riara ọria. 2 Jeroboam we si nwunye-ya, Biko, bilie, nwogharia onwe-gi, ka aghara imara na gi onwe-gi bu nwunye Jeroboam: i gēje kwa Shailo; le, n'ebe ahu ka Ahaija, bú onye-amuma, nọ; onye ahu kwuru okwu bayerem na m'gābu eze ndi nka. 3 Chiri kwa n'aka-gi ob͕e achicha iri, na achicha ntà, na karama manu-aṅu, jekuru ya: onye ahu gēgosi gi ihe gēme nwa-okoro. 4 Nwunye Jeroboam we me otú a, we bilie, je Shailo, ba n'ulo Ahaija. Ma Ahaija apughi ihu uzọ; n'ihi na anya-ya guzoro eguzo n'ihi agadi-ya. 5 Ma Jehova siri Ahaija, Le, nwunye Jeroboam nābia iju ase bayere nwa-ya nwoke n'aka-gi; n'ihi na ọ nāria ọria: otú a na ọtú a ka i gāgwa ya: ọ gēru kwa, mb͕e ọ batara, na nwayi ahu ganēme onwe-ya dika onye ala ọzọ. 6 O rue, mb͕e Ahaija nuru olu ukwu-ya ka ha nāzọ, mb͕e ọ nābata n'ọnu-uzọ, na ọ siri, Bata, nwunye Jeroboam; n'ìhi gini kwa ka gi onwe-gi nēme onwe-gi dika onye ala ọzọ? ma mu onwem bu onye-ozi siri ike n'ebe i nọ. 7 Je, si Jeroboam, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri: N'ihi na esim n'etiti ndim welie gi elu, me gi onye-ndú ndim, bú Israel, 8 we dowapu ala-eze n'ulo Devid, nye gi ya: ma i dighi ka orùm, bú Devid, onye debere ihe nile M'nyere n'iwu, o were obi-ya nile jesom, ime nání ihe ziri ezi n'anyam; 9 ma i mewo ihe ọjọ kari ndi nile buru gi uzọ, i we je mere onwe-gi chi ọzọ di iche iche, na arusi a kpuru akpu, ikpasum iwe, i we tufuem n'azu gi: 10 n'ihi nka, le, M'nēme ka ihe ọjọ biakute ulo Jeroboam, M'gēbipu kwa n'aru Jeroboam nwa-nwoke ọ bula, onye eb͕ochiri eb͕ochi na onye arapuru arapu n'Israel, M'gēkpochapu kwa nke fọduru nke ulo Jeroboam, dika madu si ekpochapu ǹsí-anu, rue mb͕e agēkpochapuzu ya. 11 Onye nke Jeroboam nke nwuru anwu n'obodo, nkita gēri ya; onye nke nwuru anwu n'ọhia, anu-ufe nke elu-igwe gēri kwa ya: n'ihi na Jehova ekwuwo ya. 12 Ma gi onwe-gi bilie, la n'ulo-gi: mb͕e ukwu-gi nābà n'obodo, nwata ahu gānwu kwa. 13 Ma Israel nile gētiri ya aka n'obi, lìe ya; n'ihi na onye a, nání ya, nime ndi Jeroboam nwere gābiaru ílì: n'ihi na ahuru nime ya ezi ihe n'ebe Jehova, bú Chineke Israel, nọ, n'ulo Jeroboam. 14 Jehova gēme kwa ka otù eze Israel biliere Ya, onye gēbipu ulo Jeroboam ubọchi a: ma gini? ọbuná ub͕u a. 15 Jehova gētib͕u kwa Israel, dika amì nēme nkpatu nime miri; Ọ gēropu kwa Israel n'ezi ala nka, nke O nyere ndi bu nna-ha, Ọ gēfesa kwa ha n'ofè Osimiri; n'ihi na ha emewo Asherim-ha, nākpasu Jehova iwe. 16 Ọ gārara kwa Israel nye n'ihi nmehie Jeroboam nile, nke o mehieworo, na nke o ji me ka Israel mehie. 17 Nwunye Jeroboam we bilie, la, biarue Tiaza: mb͕e nwayi ahu nābata na nbata-uzọ ulo, nwa-okoro ahu we nwua. 18 Israel nile we lìe ya, tiere ya aka n'obi; dika okwu Jehova si di, nke O kwuru n'aka orù-Ya, bú Ahaija onye-amuma. 19 Ma ihe nile nke fọduru nke Jeroboam mere, ka o si bu agha, na ka o si buru eze, le, edewo ha n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel. 20 Ubọchi nke Jeroboam buru eze we di orú arọ na abua: o we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, Nedab, bú nwa-ya, we buru eze n'ọnọdu ya. 21 Ma Rehoboam, bú nwa Solomon, bu eze na juda. Rehoboam b͕ara ọgu arọ abua na otù mb͕e ọ malitere ibu eze, o we buru eze arọ iri na asa nime Jerusalem, bú obodo nke Jehova rọputara n'etiti ebo nile nke Israel, itiye aha-Ya n'ebe ahu. Aha nne-ya bu Neama, bú nwayi Amon. 22 Juda we me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova; ha we were nmehie-ha nile nke ha mehiere kpasue Ya ekworo, kari ihe nile ndi bu nna-ha mere. 23 Ha onwe-ha we wu-kwa-ra onwe-ha ebe di elu, na ogidi, na Asherim, n'elu ugwu ọ bula di elu, na n'okpuru osisi ndu ọ bula; 24 Ọzọ kwa, ndi edoro nsọ ikwa iko di n'ala: ha mere dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di, bú ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel. 25 O rue, n'arọ nke-ise nke eze Rehoboam, na Shaishak, bú eze Ijipt, rigotara imegide Jerusalem: 26 o wepu àkù nile nke ulo Jehova, na àkù nile nke ulo eze; ọbuná ha nile ka o wepuru: o wepu-kwa-ra ọta ọla-edo nile nke Solomon mere. 27 Eze, bú Rehoboam, we me ọta ọla n'ọnọdu ha, nye ha n'aka ndi-isi ndi-ọb͕a-ọsọ, bú ndi nēche ọnu-uzọ ulo eze, ka ha lekọta ha anya. 28 O rue, mb͕e ọ bula eze nābà n'ulo Jehova, na ndi-ọb͕a-ọsọ nēbu ha, we bughachi ha n'ime-ulo ndi-ọb͕a-ọsọ. 29 Ma okwu Rehoboam nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda? 30 Ma agha di n'etiti Rehoboam na Jeroboam ubọchi nile. 31 Rehoboam we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Devid: aha nne-ya bu Neama, bú nwayi Amon. Abaijam nwa-ya we buru eze n'ọnọdu-ya.

1 Ndi-Eze 15

1 Ma n'arọ nke-iri-na-asatọ nke eze, bú Jeroboam nwa Nebat, ka Abaijam malitere ibu eze Juda. 2 Arọ atọ ka ọ bu eze na Jerusalem: aha nne-ya bu Meaka nwa-nwayi Abishalom. 3 Ọ nējeghari na nmehie nile nke nna-ya, nke o buru ya uzọ me: obi-ya ezughi kwa okè n'ebe Jehova, bú Chineke-ya, nọ, dika obi Devid, bú nna-ya. 4 Ma n'ihi Devid ka Jehova, bú Chineke-ya, nyere ya oriọna na Jerusalem, ime ka nwa-ya bilie n'ọnọdu ya, na ime ka Jerusalem guzo: 5 n'ihi na Devid mere ihe ziri ezi n'anya Jehova, o sighi kwa n'ihe ọ bula O nyere ya n'iwu wezuga onwe-ya ubọchi nile nke ndu-ya, ọ bu nání n'okwu Uraia onye Het. 6 Ma agha di n'etiti Rehoboam na Jeroboam ubọchi nile nke ndu-ya. 7 Ma okwu Abaijam nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda? Ma agha di n'etiti Abaijam na Jeroboam. 8 Abaijam we so nna-ya-hà dina n'ọnwu; ha we lìe ya n'obodo Devid: Esa nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya. 9 Ma n'arọ nke-orú nke Jeroboam eze Israel ka Esa malitere ibu eze Juda. 10 Ọgu arọ abua na otù ka ọ bu eze na Jerusalem: aha nne-ya bu Meaka nwa-nwayi Abishalom. 11 Esa mere ihe ziri ezi n'anya Jehova, dika Devid, bú nna-ya, mere. 12 O we me ka ndi edoro nsọ ikwa iko si n'ala-ya gabiga, o wezuga-kwa-ra arusi nile nke nna-ya-hà mere. 13 Ọzọ kwa, Meaka, bú nne-ya, o wezuga-kwa-ra ya n'ibu eze-nwayi, n'ihi na o mere ihe kpatara ima-jijiji nye Ashera; Esa we b͕utue ihe-ya kpatara ima-jijiji, o sure ya ọku na miri-iyi Kidron. 14 Ma ewezugaghi ebe di elu: otú ọ di, obi Esa zuru okè n'ebe Jehova nọ ubọchi-ya nile. 15 Ọ chibata n'ulo Jehova ihe nile nna-ya doro nsọ, na ihe nile ya onwe-ya doro nsọ, bú ọla-ọcha, na ọla-edo, na ihe di iche iche ọzọ. 16 Ma agha di n'etiti Esa na Beasha, bú eze Israel, ubọchi-ha nile. 17 Beasha, bú eze Israel, we rigo imegide Juda, wue Rema, ka ọ ghara ikwe Esa, bú eze Juda, ka o nwe onye nāpu apu ma-ọbu onye nābata abata. 18 Esa we chiri ọla-ọcha nile na ọla-edo nile nke fọduru n'àkù ulo Jehova, na àkù ulo eze nile, nye ha n'aka ndi-orù-ya: eze, bú Esa, we ziga ha jekuru Ben-hedad, nwa Tab-rimon, nwa Hezion, bú eze Siria, nke bi na Damaskọs, si, 19 Ọb͕ub͕a-ndu di n'etiti mu na gi, na n'etiti nnam na nna-gi: le, eziteworom gi onyinye, bú ọla-ọcha na ọla-edo; je, mebie ọb͕ub͕a-ndu gi na Beasha, bú eze Israel, b͕ara, ka o we si n'arum rigo. 20 Ben-hedad we ge eze, bú Esa, nti, zite ndi-isi usu nile nke ndi-agha o nwere imegide obodo nile nke Israel, o we tib͕ue Ijon, na Dan, na Ebel-bet-meaka, na Kinerot nile, tiyere ala nile nke Naftali. 21 O rue, mb͕e Beasha nuru ya, na ọ rapuru iwu Rema, we biri na Tiaza. 22 Ma eze, bú Esa, mere ka Juda nile nu; ọ dighi onye puru ya: ha we bupu nkume nile nke Rema, na osisi-ya nile, nke Beasha ji wu ya; eze, bú Esa, we were ha wue Geba Benjamin na Mizpa. 23 Ma okwu Esa nile nke fọduru, na idi-ike-ya nile, na ihe nile o mere, na obodo nile o wuru, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda? Nání na ọ riara ọria n'ukwu-ya abua na mb͕e agadi-ya. 24 Esa we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Devid, bú nna-ya: Jehoshafat nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya. 25 Ma Nedab, bú nwa Jeroboam, malitere ibu eze Israel n'arọ nke-abua nke Esa, bú eze Juda, ọ we buru eze Israel arọ abua. 26 O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, je ije n'uzọ nna-ya, na nime nmehie-ya nke o ji me ka Israel mehie. 27 Beasha, bú nwa Ahaija, nke ulo Isaka, we kekọta madu imegide ya; Beasha we tib͕ue ya na Gibeton, nke diri ndi Filistia; n'ihi na Nedab na Israel nile nānọchigide Gibeton n'agha. 28 Beasha we me ka ọ nwua n'arọ nke-atọ nke Esa, bú eze Juda, o we buru eze n'ọnọdu ya. 29 O rue, mb͕e ọ malitere ibu eze, na o tib͕uru ulo Jeroboam nile; o kweghi ka onye ọ bula nke nēku ume fọduru Jeroboam, rue mb͕e o kpochapuru ya; dika okwu Jehova si di, nke O kwuru n'aka orù-Ya, bú Ahaija onye Shailo: 30 n'ihi nmehie nile nke Jeroboam nke o mehiere, na nke o ji me ka Israel mehie; nime nkpasu-iwe-ya nke o ji kpasu Jehova, bú Chineke Israel, iwe. 31 Ma okwu Nedab nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel? 32 Ma agha di n'etiti Esa na Beasha, bú eze Israel, ubọchi-ha nile. 33 N'arọ nke-atọ nke Esa, bú eze Juda, ka Beasha, bú nwa Ahaija, malitere ibu eze Israel nile nime Tiaza, orú arọ na anọ. 34 O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, je ije n'uzọ Jeroboam, na nime nmehie-ya nke o ji me ka Israel mehie.

1 Ndi-Eze 16

1 Okwu Jehova we rue Jihu, bú nwa Hanani, nti, imegide Beasha, si, 2 N'ihi na esim n'ájá welie gi elu, me gi onye-ndú ndim, bú Israel; i we je ije n'uzọ Jeroboam, me ndim, bú Israel, ka ha mehie, iwere nmehie nile ha kpasuem iwe; 3 le, M'nēkpochapu nke fọduru nke Beasha, bú nke fọduru nke ulo-ya; M'gēme kwa ulo-gi ka ọ di ka ulo Jeroboam, bú nwa Nebat. 4 Onye nke Beasha nke nwuru anwu n'obodo, nkita gēri ya; onye nke ya nke nwuru anwu n'ọhia, anu-ufe nke elu-igwe gēri kwa ya. 5 Ma okwu Beasha nile nke fọduru, na ihe o mere, na idi-ike-ya, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel? 6 Beasha we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya na Tiaza; Ila, bú nwa-ya, we buru eze n'ọnọdu ya. 7 Ọzọ kwa, n'aka Jihu, bú nwa Hanani, onye-amuma, ka okwu Jehova biara imegide Beasha, na imegide ulo-ya, ma n'ihi ihe ọjọ nile nke o mere n'anya Jehova, iwere omume aka-ya kpasue Ya iwe, n'idi ka ulo Jeroboam; ma n'ihi na o tib͕uru ya. 8 N'arọ nke-orú-na-isi nke Esa, bú eze Juda, ka Ila nwa Beasha malitere ibu eze Israel nime Tiaza, arọ abua. 9 Orù-ya Zimri, bú onye-isi nkera ub͕ọ-ala-ya, we kekọta madu imegide ya: ma ya onwe-ya nọ na Tiaza, nāṅu manya nāṅubiga ya okè n'ulo Aza, onye bu onye-isi ulo-ya na Tiaza: 10 Zimri we ba, tib͕ue ya, me ka ọ nwua, n'arọ nke-orú-na-asa nke Esa, bú eze Juda, o we buru eze n'ọnọdu ya. 11 O rue, mb͕e ọ malitere ibu eze, mb͕e ọ nọkwasiri n'oche-eze-ya, na o tib͕uru ulo Beasha nile: o kweghi ka otù nwa-nwoke fọduru ya, ma ọ bu nime ndi-ikwu-ya, ma-ọbu nime ndi-eyì-ya. 12 Zimri we kpochapu ulo Beasha nile, dika okwu Jehova si di, nke O kwuru megide Beasha n'aka Jihu, bú onye-amuma, 13 bayere nmehie nile nke Beasha, na nmehie nile nke Ila, bú nwa-ya, nke ha mehiere, na nke ha ji me Israel mehie, iwere ihe-efu nile ha kpasue Jehova, bú Chineke Israel, iwe. 14 Ma okwu Ila nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel? 15 N'arọ nke-orú-na-asa nke Esa, bú eze Juda, ka Zimri bu eze ubọchi asa na Tiaza. Ma ndi Israel nọ n'ọmuma-ulo-ikwū imegide Gibeton, nke diri ndi Filistia. 16 Ndi nọ n'ọmuma-ulo-ikwū we nu, si, Zimri ekekọtawo madu, ọzọ kwa, o tib͕uwo eze: Israel nile we me Ọmri, bú onye-isi usu-ndi-agha, ka ọ buru eze Israel n'ubọchi ahu n'ọmuma-ulo-ikwū. 17 Ọmri we si na Gibeton rigo, ya na Israel nile, ha we nọchigide Tiaza n'agha. 18 O rue, mb͕e Zimri huru na ewerewo obodo, na ọ bara n'ulo-elu nke ulo eze, sure ulo eze n'ọku n'isi onwe-ya, nwua, 19 n'ihi nmehie-ya nile nke ọ mehiere, n'ime ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, n'ije ije n'uzọ Jeroboam, na nime nmehie nke o mere, ime ka Israel mehie. 20 Ma okwu Zimri nile nke fọduru, na nkekọta nke ọ kekọtara madu imegide eze, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel? 21 Mb͕e ahu ekewara ndi Israel na nkera abua: otù nkera ndi Israel soro Tibni, bú nwa Ginat, ime ya ka ọ buru eze; nkera ọzọ soro Ọmri. 22 Ndi soro Ọmri we di ike kari ndi soro Tibni, bú nwa Ginat: Tibni we nwua, Ọmri we buru eze. 23 N'arọ nke-orú-na-iri-na-otù nke Esa, bú eze Juda, ka Ọmri malitere ibu eze Israel, arọ iri na abua: ọ bu eze na Tiaza arọ isi. 24 Ọ zuru ugwu Sameria n'aka Shema na talent ọla-ọcha abua; o wue ulo n'ugwu ahu, kpọ aha obodo ahu o wuru Sameria, n'aha Shema, bú onye-nwe ugwu ahu. 25 Ọmri mere ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, me kwa ihe ọjọ kari ndi nile buru ya uzọ. 26 Ọ je ije n'uzọ nile nke Jeroboam, bú nwa Nebat, na nime nmehie-ya nile nke o jiri me ka Israel mehie, iwere ihe-efu nile ha kpasue Jehova, bú Chineke Israel, iwe. 27 Ma ihe Ọmri nile nke fọduru, bú nke o mere, na ihe idi-ike-ya nke o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel? 28 Ọmri we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya na Sameria: Ehab, bú nwa-ya, we buru eze n'ọnọdu ya. 29 Ma n'arọ nke-orú-na-iri-na-asatọ nke Esa, bú eze Juda, ka Ehab, bú nwa Ọmri, malitere ibu eze Israel: Ehab nwa Ọmri we buru eze Israel nime Sameria orú arọ na abua. 30 Ehab nwa Ọmri mere ihe jọrọ njọ n'anya Jehova kari ndi nile buru ya uzọ. 31 O rue, dika agāsi na ọ bu ihe nfe na ọ nējeghari na nmehie nile nke Jeroboam, bú nwa Nebat, na ọ luru Jezebel na nwunye, bú nwa-nwayi Etbeal eze ndi Zaidon, ọ we je fè Beal òfùfè, kpọ kwa isi ala nye ya. 32 O we me ka ebe-ichu-àjà guzoro Beal n'ulo Beal, nke o wuru na Sameria. 33 Ehab me-kwa-ra Ashera; Ehab we me ihe ọzọ ikpasu Jehova, bú Chineke Israel, iwe, kari ndi-eze nile nke Israel ndi buru ya uzọ. 34 N'ubọchi-ya ka Hiel, bú onye Bet-el, wuru Jeriko: Abairam, bú ọkpara-ya, ka o were tọ ntọ-ala-ya; Segub, bú nwa-ya nwoke nke-ntà ka ọ were kwa guzo ọnu-uzọ-ama-ya ọtọ; dika okwu Jehova si di, nke O kwuru n'aka Joshua nwa Nun.

1 Ndi-Eze 17

1 Elaija, bu onye Tisbe, onye sitere na ndi-nnọdu nke Gilead, we si Ehab, Jehova, bú Chineke nke Israel, nādi ndu, Onye m'guzoworo n'iru Ya, igirigi ma-ọbu miri-ozuzo agaghi-adi ma-ọli n'arọ ndia, ma ọ bu nání dika okwum si di. 2 Okwu Jehova we rue ya nti, si, 3 Si n'ebe a pua, chere onwe-gi iru n'Iru-anyanwu, zo onwe-gi na miri-iyi Kerit, nke di n'iru Jọdan. 4 O gēru kwa, na i gāṅu miri sitere na miri-iyi ahu; ọ bu kwa ugolo-ọma ka M'nyeworo iwu izù gi n'ebe ahu. 5 O we je, me dika okwu Jehova si di: o je biri na miri-iyi Kerit, nke di n'iru Jọdan. 6 Ugolo-ọma we nēbutere ya achicha na anu n'ututu, na achicha na anu n'anyasi; ọ nāṅu kwa miri sitere na miri-iyi ahu. 7 O rue, mb͕e ubọchi ufọdu gasiri, na miri-iyi ahu takọrọ, n'ihi na miri-ozuzo adighi n'ala. 8 Okwu Jehova we rue ya nti, si, 9 Bilie, je Zarefat, nke diri Zaidon, biri n'ebe ahu: le, enyewom otù nwayi di-ya nwuru nọ n'ebe ahu iwu izù gi. 10 O we bilie, je Zarefat, biarue ọnu-uzọ-ama obodo ahu, ma, le, n'ebe ahu ka nwayi di-ya nwuru nọ nāchikọta nkú: o we kpọ ya òkù, si, Biko, kuterem nwantī miri n'ihe, ka m'we ṅua. 11 O we je ikute ya, Elaija we kpọ ya òkù, si, Biko, wetaram iberibe achicha n'aka-gi. 12 Nwayi ahu we si, Jehova, bú Chineke-gi, nādi ndu, Ọ dighi ob͕e achicha m'nwere ma-ọli, ma nání otù nju-aka utu ọka n'okpokoro, na nwantī manu n'ite: ma, le, anamachikọta nkú abua, ka m'we ba, were ya doziere onwem, dozi-kwa-ra nwam nwoke, ka ayi we rie ya, nwua. 13 Elaija we si ya, Atula egwu; ba, mere dika okwu-gi si di: nání buru uzọ merem ob͕e achicha ntà site na ya, weputaram ya, ma mere onwe-gi, me-kwa-ra nwa-gi nwoke, n'ikpe-azu. 14 N'ihi na otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Okpokoro utu ọka ahu agaghi-agwu, ite manu ahu agaghi-akọ gi kwa, rue ubọchi Jehova gēnye miri-ozuzo n'elu uwa. 15 O we je me dika okwu Elaija si di: nwayi ahu we rie, ya onwe-ya, na Elaija, na ulo-ya, ọtutu ubọchi. 16 Okpokoro utu ọka ahu agwughi, ite manu ahu akọghi kwa, dika okwu Jehova si di, nke O kwuru n'aka Elaija. 17 O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na nwa nke nwayi ahu, bú nwayi nwe ulo, riara ọria; ọria-ya we di ike nke-uku, rue mb͕e ume nāfọdughi nime ya. 18 Nwayi ahu we si Elaija, Gini ka mu na gi nwekọrọ, gi onye nke Chineke? ì biakutewom ime ka echeta nmehiem, na ime ka nwam nwoke nwua? 19 Ọ si ya, Nyem nwa-gi nwoke. O we kuputa ya n'obi-ya, kugo ya n'ime-ulo-elu, ebe ya onwe-ya nānọdu, ọ tọb͕ọ ya n'ihe-ndina-ya. 20 Ọ kpọkue Jehova, si, Jehova, bú Chinekem, ọ̀ bu kwa nwayi a di-ya nwuru, nke mu onwem nānọ n'ulo-ya dika ọbìa, ka I mejọworo, n'ime ka nwa-ya nwoke nwua? 21 O setia onwe-ya n'aru nwata ahu ub͕ò atọ, kpọkue Jehova, si, Biko, Jehova, bú Chinekem, ka nkpuru-obi nwata nka biaghachi nime ya. 22 Jehova we ge nti olu Elaija; nkpuru-obi nwata ahu we biaghachi nime ya, ọ we di ndu. 23 Elaija we kuru nwata ahu, si n'ime-ulo-elu ahu kudata ya n'ulo, nye ya nne-ya: Elaija we si, Le, nwa-gi nādi ndu. 24 Nwayi ahu we si Elaija, Ub͕u a amawom nka na onye nke Chineke ka i bu, na okwu Jehova bu kwa ezi-okwu n'ọnu-gi.

1 Ndi-Eze 18

1 O rue, mb͕e ọtutu ubọchi gasiri, na okwu Jehova ruru Elaija nti, n'arọ nke-atọ, si, Je, me ka Ehab hu gi anya; M'gēnye kwa miri-ozuzo n'elu uwa. 2 Elaija we je ime ka Ehab hu ya anya. Ma oké unwu ahu siri ike na Sameria. 3 Ehab we kpọ Obadaia, onye bu onye-isi ulo-ya. (Ma Obadaia nātu egwu Jehova nke-uku: 4 o we rue, mb͕e Jezebel bipuru ndi-amuma Jehova, na Obadaia chiri ọgu ndi-amuma ise, zo ha, ọgu ndikom abua na iri n'otù ọb͕à, were achicha na miri zùa ha. ) 5 Ehab we si Obadaia, Jegharia n'ala, rue isi-iyi nile nke miri, ru kwa miri-iyi nile: eleghi anya ayi gāchọta ahihia, we me ka inyinya na inyinya mule di ndu, ka ayi we ghara ibipu anu n'anu-ulo-ayi. 6 Ha we kewara onwe-ha ala ahu igabiga nime ya: Ehab jere n'otù uzọ, nání ya, Obadaia je-kwa-ra n'uzọ ọzọ, nání ya. 7 Obadaia we nọ n'uzọ, ma, le, Elaija zutere ya: ọ mata ya, da kpue iru-ya n'ala, si, Ọ̀ bu gi bu nka, onye-nwem Elaija? 8 Ọ si ya, Mu ka ọ bu: je, si onye-nwe-gi, Le, Elaija abiawo. 9 Ọ si, Gini ka m'mehieworo, na gi onwe-gi nēnye orù-gi n'aka Ehab, ime ka m'nwua? 10 Jehova, bú Chineke-gi, nādi ndu, ọ dighi mba ma-ọbu ala-eze ma-ọli, ebe onye-nwem nēzigaghi ichọ gi: ma mb͕e ha siri, Ọ nọghi n'ebe a, o me ka ala-eze ahu na mba ahu ṅua iyi, na ha achọtaghi gi. 11 Ma ub͕u a gi onwe-gi nāsi, Je, si onye-nwe-gi, Le, Elaija abiawo. 12 Ọ gēru kwa, mb͕e mu onwem si n'ebe i nọ je, na Mọ nke Jehova gēburu gi jerue ebe m'nāmaghi; ma mb͕e m'biara igosi Ehab, ma ọ chọtaghi gi, ọ gēb͕ukwam: ma orù-gi nātu egwu Jehova site na mb͕e m'di na nwata. 13 Ègosighi onye-nwem ihe m'mere mb͕e Jezebel b͕uru ndi-amuma Jehova, na ezorom ọgu ndikom ise sitere na ndi-amuma Jehova, ọgu ndikom abua na iri n'otù ọb͕à, ogu ndikom abua na iri n'otù ọb͕à, were achicha na miri zùa ha? 14 Ma ub͕u a gi onwe-gi nāsi, Je, si onye-nwe-gi, Le, Elaija abiawo: ọ gēb͕ukwam. 15 Elaija we si, Jehova nke usu nile nke ndi-agha nādi ndu, Onye m'guzoworo n'iru Ya, n'ezie ta ka m'gēme ka ọ hum anya. 16 Obadaia we je izute Ehab, gosi ya: Ehab we je izute Elaija. 17 O rue, mb͕e Ehab huru Elaija, na Ehab siri ya, Ọ̀ bu gi bu nka, gi onye nēmekpa Israel aru? 18 Ọ si, Emekpaghm Israel aru; kama ọ bu gi onwe-gi, na ulo nna-gi, nime nrapu unu rapuworo ihe nile Jehova nyere n'iwu, i we jeso Bealim. 19 Ma ub͕u a ziga, chikọtaram Israel nile rue ugwu Kamel, na ndi-amuma Beal, ndi di nnù madu na ọgu abua na iri, na ndi-amuma Ashera, ndi di nnù madu, ndi nēri ihe na table Jezebel. 20 Ehab we zisa ozi n'etiti umu Israel nile, chikọta ndi-amuma ahu rue ugwu Kamel. 21 Elaija we biarue ndi Israel nile nso, si, Rùe ole mb͕e ka unu onwe-unu ganārughari n'etiti uzọ abua ndia? ọ buru na Jehova bu Chineke, jesonu Ya: ọ buru Beal, jesonu ya. Ma ndi Israel azaghi ya okwu ọ bula. 22 Elaija we si ndi Israel, Mu onwem, abum onye-amuma Jehova fọduru, náním; ma ndi-amuma Beal di nnù ndikom na ọgu abua na iri. 23 Ka ha nye kwa ayi oke-ehi abua; ka ha rọputa-kwa-ra onwe-ha otù oke-ehi, bọ ya n'ọbubọ-ya, tukwasi ya n'elu nkú, ma ka ha ghara itiye ọku: mu onwem gēdozi kwa oke-ehi nke-ọzọ, tiye n'elu nkú, ma m'gaghi-etiye ọku. 24 Unu gākpọku kwa aha chi-unu, ma mu onwem gākpọku aha Jehova: ọ gēru kwa, na chi ahu nke nēwere ọku za, onye ahu bu Chineke. Ndi Israel nile we za, si, Ọ di nma, bú okwu a. 25 Elaija we si ndi-amuma Beal, Rọputaranu onwe-unu otù oke-ehi, buru uzọ dozie ya; n'ihi na unu onwe-unu di ọtutu; kpọku-kwa-nu aha chi-unu, ma unu etiyela ọku. 26 Ha we were oke-ehi nke enyere ha, ha we dozie ya, kpọkue aha Beal site n'ututu we rue etiti-ehihie, si, Beal, za ayi. Ma ọ dighi olu di, ọ dighi kwa onye nāza. Ha we wukwasi n'elu ebe-ichu-àjà nke emere. 27 O rue, n'etiti-ehihie, na Elaija kwara ha emò, si, Werenu oké olu kpọ: n'ihi na chi ka ọ bu; n'ihi na ọ nātughari uche-ya, ma-ọbu na o wezugawo onwe-ya, ma-ọbu na ọ nọ n'ije, ma-ọbu eleghi anya ya onwe-ya nāraru ura, ma ọ gēteta. 28 Ha we were oké olu kpọ, were mma-agha na ube bìe aru onwe-ha dika ha si eme, rue mb͕e ọbara wukwasiri ha. 29 O rue, mb͕e etiti-ehihie gasiri, na ha nēbu amuma rue mb͕e nsure onyinye-inata-iru-ọma; ma ọ dighi olu di, ọ dighi kwa onye nāza, ọ dighi kwa ọṅuṅa-nti di. 30 Elaija we si ndi Israel nile, Biaruenu nsom; ndi Israel nile we biarue ya nso. O dozie ebe-ichu-àjà Jehova nke etipiara. 31 Elaija we chiri nkume iri na abua, dika ọnu-ọgugu ebo umu Jekob si di, bú onye okwu Jehova ruru nti, si, Israel gābu aha-gi. 32 Ọ chiri nkume ahu wue ebe-ichu-àjà n'aha Jehova; ọ me ebe miri gādọrọ, ra ka ebe gānagide mb͕é nkpuru-ọghigha abua, buruburu ebe-ichu-àjà. 33 O do nkú n'usoro, bọ oke-ehi-ya n'ọbubọ-ya, tukwasi ya n'elu nkú. Ọ si, B͕ajuenu okpokoro anọ miri, wukwasi ya n'elu àjà-nsure-ọku, na n'elu nkú. 34 Ọ si, Menu ya nke ub͕ò abua; ha we me ya nke ub͕ò abua. Ọ si, Menu ya nke ub͕ò atọ; ha we me ya nke ub͕ò atọ. 35 Miri ahu we nērughari ebe-ichu-àjà ahu buruburu; ọ b͕aju kwa ebe ahu miri nādọrọ miri. 36 O rue, na mb͕e nsure onyinye-inata-iru-ọma, na Elaija, bú onye-amuma, biaruru nso, si, Jehova, bú Chineke Abraham na Aisak na Israel, ka amara ta na Gi onwe-gi bu Chineke n'Israel, na mu onwem bu kwa orù-Gi, na ọ bu kwa n'okwu-Gi ka m'meworo ihe nile ndia. 37 Zam, Jehova, zam, ka ndi nka we mara na Gi onwe-gi, Jehova, bu Chineke, na Gi onwe-gi echighariwo kwa obi-ha ilata. 38 Ọku Jehova we da, ripia àjà-nsure-ọku ahu, na nkú-ya, na nkume nile, na àjà, rachapu kwa miri nke di n'ebe ahu miri dọrọ. 39 Ndi Israel nile we hu ya, da kpue iru-ha n'ala, si, Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke; Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke. 40 Elaija we si ha, Jidenu ndi-amuma Beal; ekwela ka otù nwoke nime ha wepuga onwe-ya. Ha we jide ha: Elaija we me ka ha ridarue miri-iyi Kaishon, o b͕ue ha n'ebe ahu. 41 Elaija we si Ehab, Rigo, rie ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu; n'ihi na olu ùzù oké miri-ozuzo nāda. 42 Ehab we rigo iri ihe na iṅu ihe-ọṅuṅu. Ma Elaija rigoro n'elu ugwu Kamel; o ruru ala, tiye iru-ya n'etiti ikperè-ya abua. 43 Ọ si nwa-okorọbia-ya, Biko, rigo, legide anya n'uzọ oké osimiri. Ọ rigo, legide anya, si, Ọ dighi ihe ọ bula di. Ọ si, Jeghachi ub͕ò asa. 44 O rue, na nke ub͕ò asa, na ọ siri, Le, igwe-oji, nke di ntà dika ọbu-aka madu, nēsi n'oké osimiri rigoputa. Ọ si, Rigo, si Ehab, Dozie ub͕ọ-ala-gi, rida, ka miri-ozuzo we ghara ib͕ochi gi. 45 O rue, na nwa mb͕e ntà, na elu-igwe jiri nji n'igwe-oji na ifufe, oké miri-ozuzo di uku we di. Ehab we nọkwasi n'ub͕ọ-ala, la na Jezreel. 46 Aka Jehova we di n'aru Elaija; o we ke ihe-ọkiké n'úkwù-ya, b͕a ọsọ n'iru Ehab, rue ebe i nābà Jezreel.

1 Ndi-Eze 19

1 Ehab we gosi Jezebel ihe nile Elaija mere, na ihe nile otú o were mma-agha b͕ue ndi-amuma nile. 2 Jezebel we zigara Elaija onye-ozi, si, Ka chi me otú a, ka ha me kwa ihe ọzọ otú a, ma asi na emeghm ndu-gi ka ọ di ka ndu otù onye nime ha dika mb͕e a echi. 3 O we tua egwu, bilie, je n'ihi ndu-ya, biarue Bia-sheba, nke Juda nwere, o me ka nwa- okorọbia-ya nọdu n'ebe ahu. 4 Ma ya onwe-ya jere ije otù ubọchi n'ọzara, bia nọdu n'okpuru otù osisi broom: ọ riọ Chineke ndu-ya ka ọ nwua, si, O zuwo; ub͕u a, Jehova, wepu ndum; n'ihi na mu onwem adighi nma kari nnam-hà. 5 O dina, raru ura n'okpuru otù osisi broom; ma, le, mọ-ozi nēmetu ya aka, si ya, Bilie, rie ihe. 6 O we legide anya, ma, le, ob͕e achicha, nke esiri n'elu nkume di ọku, na ite miri di n'akuku isi-ya. O rie, ṅu kwa, dina kwa ọzọ. 7 Mọ-ozi nke Jehova we biaghachi nke ub͕ò abua, metu ya aka, si, Bilie, rie ihe; n'ihi na ije riri nne kari ike-gi. 8 O we bilie, rie ihe, ṅu kwa miri, je n'ike ihe-oriri ahu ọgu ubọchi abua ehihie na abali rue ugwu Chineke, bú Horeb. 9 Ọ bia n'ebe ahu rue ọb͕à, nọ ọnọdu-abali n'ebe ahu; ma, le, okwu Jehova ruru ya nti, si ya, Gini ka i nēme n'ebe a, Elaija? 10 Ọ si, Ekwoworom Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, ekworo nke-uku; n'ihi na umu Israel arapuwo ọb͕ub͕a-ndu-Gi, tipia ebe-ichu-àjà-Gi nile, were mma-agha b͕ue ndi-amuma-Gi: ọ fọduru mu onwem, náním; ha nāchọ kwa ndum, iwepu ya. 11 Ọ si, Pua, guzo n'ugwu n'iru Jehova. Ma, le, Jehova nāgabiga, oké ifufe di ike nāb͕ọwa kwa ugwu nile, nētipia kwa nkume di elu nile n'iru Jehova; ma Jehova anọghi n'ifufe ahu: ma mb͕e ifufe gasiri ala-ọma-jijiji mara; ma Jehova anọghi n'ala-ọma-jijiji ahu: 12 ma mb͕e ala-ọma-jijiji gasiri ọku we di; ma Jehova anọghi n'ọku ahu: ma mb͕e ọku gasiri olu ntà nke di ezi nwayọ dara. 13 O rue, mb͕e Elaija nuru ya, na ọ huchiri iru-ya n'uwe-nwuda-ya, pua, guzo n'ọnu-uzọ ọb͕à ahu. Ma, le, olu ruru ya nti, si, Gini ka i nēme n'ebe a, Elaija? 14 Ọ si, Ekwoworom Jehova, bú Chineke usu-ndi-agha, ekworo nke-uku; n'ihi na umu Israel arapuwo ọb͕ub͕a-ndu-Gi, tipia ebe-ichu-àjà-Gi nile, were mma-agha b͕ue ndi-amuma-Gi; ọ fọduru mu onwem, náním; ha nāchọ kwa ndum, iwepu ya. 15 Jehova we si ya, Je, laghachi n'uzọ-gi rue ọzara Damaskọs: ma mb͕e i biara, i gēte Hazael manu ibu eze Siria: 16 i gēte kwa Jihu, bú nwa Nimshi, manu ibu eze Israel: i gēte kwa Elaisha, bú nwa Shefat, nke Ebel-mehola, ibu onye-amuma n'ọnọdu gi. 17 Ọ gēru kwa, na onye nēwepuga onwe-ya na mma-agha Hazael, Jihu gēme ka ọ nwua: onye nēwepuga kwa onwe-ya na mma-agha Jihu, Elaisha gēme ka ọ nwua. 18 Ma M'gēme ka nnù madu iri-na-asa na ọgu iri fọdu n'Israel, bú ikperè nile nke anēb͕ughi nye Beal, na ọnu ọ bula nke nēsutughi ya. 19 O si n'ebe ahu je, chọta Elaisha nwa Shefat, ma onye ahu nēme ka ehi-ya dọghari ihe eji gwu ala ubi, orú ehi na anọ ejikọrọ abua abua di n'iru ya, ya onwe-ya nọye-kwa-ra ehi abua nke-iri-na-abua: Elaija we gabiga jekuru ya, wusara ya uwe-nwuda-ya. 20 O we rapu ìgwè ehi-ya, b͕aso Elaija n'azu, si, Biko, ka m'sutu nnam na nnem ọnu, m'gējeso kwa gi. Ọ si ya, Laghachi; n'ihi na ọ̀ bu gini ka m'meworo gi? 21 O we si n'iso ya laghachi, were ehi abua ahu ejikọrọ n'otù, b͕ue ha, o were kwa ihe ehi ahu ji alu ọlu sie anu-ha, o nye ndi ahu, ha rie. O bilie, jeso Elaija, we jere ya ozi.

1 Ndi-Eze 20

1 Ma Ben-hedad, bú eze Siria, chikọtara usu-ndi-agha-ya nile: orú ndi-eze na iri na abua soro kwa ya, ha na inyinya na ub͕ọ-ala: o we rigo, nọchigide Sameria n'agha, buso ya agha. 2 O we zigara Ehab, bú eze Israel, ndi-ozi, rue obodo, si ya, 3 Otú a ka Ben-hedad siri, Ọla-ọcha-gi na ọla-edo-gi, nkem ka ọ bu; ndinyom-i kwa na umu-gi, bú nke di nma kari, nkem ka ha bu. 4 Eze Israel we za, si, Dika okwu-gi si di, Onye-nwem, eze; nke gi ka mu onwem na ihe nile m'nwere bu. 5 Ndi-ozi ahu we biaghachi, si, Otú a ka Ben-hedad kwuru, si, N'ezie eziterem i ozi, si, Ọla-ọcha-gi na ọla-edo-gi na ndinyom-i na umu-gi, mu ka i gēnye ha; 6 ma m'gēzitere gi ndi-orùm dika mb͕e a echi, ha gāchọ kwa n'ulo-gi, na ulo ndi-orù-gi; ọ gēru kwa, na ihe ọ bula anya-gi nāchọsi ike, ha gētiye ya n'aka-ha, were ya. 7 Eze Israel we kpọ ndi-okenye nile nke ala, si, Biko, maranu, hu kwa, na ọ bu ihe ọjọ ka nwoke a nāchọ: n'ihi na o ziterem ozi ichinye ya ndinyom nkem, na ichinye ya umum, na inye ya ọla-ọcham, na inye ya ọla-edom; ma eb͕ochighm ha n'aka-ya. 8 Ndi-okenye nile na ndi Israel nile we si ya, Anula okwu-ya, ekwe-kwa-la. 9 O we si ndi-ozi Ben-hedad, Sinu onye-nwem, bú eze, Ihe nile i buru uzọ zitere orù-gi ozi ime, nke ahu ka m'gēme: ma ihe a, apughm ime ya. Ndi-ozi we la, weghachiri ya okwu. 10 Ben-hedad we zigara ya ozi, si, Ka chi mem otú a, ka ha mekwam ihe ọzọ otú a, asi na ájá Sameria gēzu nju-aka inye ndi nile nọ n'ukwum. 11 Eze Israel we za, si, Kwuenu, si ya, Ka onye nēke ekike-agha-ya ghara ito onwe-ya dika onye nēkepu ya. 12 O rue, mb͕e Ben-hedad nuru okwu a, mb͕e ọ nāṅu ihe-ọṅuṅu, ya onwe-ya na ndi-eze, n'ulo-ntu, na ọ siri ndi-orù-ya, Donu onwe-unu n'usoro. Ha we do onwe-ha n'usoro imegide obodo ahu. 13 Ma, le, otù onye-amuma biaruru Ehab, bú eze Israel, nso, si, Otú a ka Jehova siri, Ì huwo oké ìgwè madu nile a? le, anamenye ya n'aka-gi ta; i gāma kwa na Mu onwem bu Jehova. 14 Ehab we si, Sìte n'aka onye? Ọ si, Otú a ka Jehova siri, Site n'aka umu-okorọbia nke ndi-isi ala anāchi achi. Ọ si, Ònye gāmalite agha ahu? Ọ si, Gi onwe-gi. 15 O we gukọta umu-okorọbia nke ndi-isi ala anāchi achi, ha we di ọgu iri-na-otù na iri na abua: mb͕e agukọtasiri ha ọ gukọta ndi-ya nile, bú umu Israel nile, nnù iri-na-asa na ọgu iri. 16 Ha we pua n'etiti-ehihie. Ma Ben-hedad nāṅu manya nāṅubiga ya okè n'ulo-ntu-ya, ya onwe-ya na ndi-eze, bú orú ndi-eze na iri na abua ahu ndi nēyere ya aka. 17 Umu-okorọbia nke ndi-isi ala anāchi achi we buru uzọ pua; Ben-hedad we zipu, ha we gosi ya, si, Ndikom esiwo na Sameria puta. 18 Ọ si, Ọ buru na ọ bu okwu udo ka ha putaworo, jidenu ha na ndu: ọ buru kwa na ọ bu ibu agha ka ha putaworo, jidenu ha na ndu. 19 Ma ndia siri n'obodo pua, bú umu-okorọbia nke ndi-isi ala anāchi achi, na usu-ndi-agha ndi soro ha n'azu. 20 Ha we tib͕ue, nwoke ọ bula nwoke-ibe-ya; ndi Siria we b͕alaga, Israel we chua ha n'azu: Ben-hedad, bú eze Siria, we wepuga onwe-ya n'elu inyinya, ya na ndi-inyinya. 21 Eze Israel we pua, tib͕ue inyinya na ub͕ọ-ala, o tib͕u-kwa-ra ntib͕u uku n'etiti ndi Siria. 22 Onye-amuma ahu we biarue eze Israel nso, si ya, Je ime onwe-gi ka i di ike, mara, hu kwa ihe i nēme: n'ihi na n'ọb͕ub͕a arọ ka eze Siria ganārigota imegide gi. 23 Ma ndi-orù eze Siria siri ya, Chi ukwu ka chi-ha bu; n'ihi ya ka ha di ike kari ayi: ma otú ọ di, ka ayi buso ha agha n'ala di lari, ayi aghaghi kwa idi ike kari ha. 24 Ma me ihe a; wezuga ndi-eze, nwoke ọ bula n'ebe-ya, do ndi nāchi ala n'ọnọdu ha: 25 ma gi onwe-gi, gutara onwe-gi usu-ndi-agha, dika usu-ndi-agha nke dapunariworo gi n'agha, inyinya n'ọnọdu inyinya, na ub͕ọ-ala n'ọnọdu ub͕ọ-ala: ayi gēbuso kwa ha agha n'ala di lari, ayi aghaghi kwa idi ike kari ha. O we ge nti olu-ha, me otú a. 26 O rue, n'ọb͕ub͕a arọ, na Ben-hedad gukọtara ndi Siria, rigorue Efek, ibuso Israel agha. 27 Agukọta-kwa-ra umu Israel, nye ha ihe-oriri, ha we je izute ha: umu Israel we ma ulo-ikwū-ha n'iru ha dika ìgwè ewu ntà abua; ma ndi Siria juputara ala. 28 Onye nke Chineke we biarue nso, gwa eze Israel okwu, si, Otú a ka Jehova siri, N'ihi na Siria asiwo, Chi ugwu ka Jehova bu, ma Ọ bughi chi ndagwurugwu; n'ihi ya ka M'gēnye ìgwè uku a nile n'aka-gi, unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova. 29 Ha we nọ n'ọmuma-ulo-ikwū, ndi Israel na ncherita-iru ndi Siria, ubọchi asa. O rue, n'ubọchi nke-asa, na agha biaruru nso; umu Israel we tib͕ue Siria, orú nnù ndikom uzọ iri-na-abua na nnù iri, bú ndi ji ukwu eje, n'otù ubọchi. 30 Ndi fọduru we b͕alaga n'Efek, rue obodo; mb͕idi obodo we dakwasi orú nnù ndikom atọ na nnù asa na ọgu iri fọduru. Ma Ben-hedad b͕alagara, ba n'obodo, n'ime-ulo nke di n'ime-ulo. 31 Ndi-orù-ya we si ya, Biko, le, ayi anuwo na ndi-eze ulo Israel, na eze ebere ka ha bu: biko, ka ayi ke ákwà-nkpe n'úkwù-ayi, na udọ̀ n'isi-ayi, pukuru eze Israel: eleghi anya ọ gēdebe gi ndu. 32 Ha we ke ákwà-nkpe n'úkwù-ha, na udọ̀ n'isi-ha, biakute eze Israel, si, Orù-gi, bú Ben-hedad, siri, Biko, ka mu onwem di ndu. Ọ si, Ọ̀ nọ ndu ub͕u a? nwa-nnem ka ọ bu. 33 Ma ndikom ahu nāriba ama, ha we me ngwa imata ma ọ bu ihe si n'obi-ya puta; ha we si, Nwa-nne-gi, bú Ben-hedad. Ọ si, Banu n'obodo, kuta ya. Ben-hedad we pukute ya; o me ya ka ọ rigota n'ub͕ọ-ala-ya. 34 Ben-hedad we si ya, Obodo nile nke nnam nara n'aka nna-gi, m'gēnyeghachi gi ha; i gākwa-kwa-ra onwe-gi amá nime Damaskọs, dika nnam kwara nime Sameria. Ma mu onwem, ka Ehab kwuru, n'ọb͕ub͕a-ndu nka ka m'gēzilaga gi. Ya na ya we b͕a ndu, o we zilaga ya. 35 Ma otù nwoke n'etiti umu ndi-amuma siri ibe-ya n'okwu Jehova, Biko, tiem ihe. Ma nwoke ahu juru iti ya ihe. 36 O we si ya, N'ihi na i geghi nti olu Jehova, le, mb͕e i nēsi n'ebe m'nọ la, ọdum gēb͕u gi. O si n'akuku ya la, ọdum we chọta ya. b͕ue ya. 37 O we chọta nwoke ọzọ, si, Biko, tiem ihe. Nwoke ahu we tie ya ihe, nēti ya nēb͕u kwa ya mma. 38 Onye-amuma ahu we je, guzoro eze n'uzọ, nwogharia onwe-ya, nātukwasi ákwà-ike-n'isi n'anya-ya abua. 39 O rue, mb͕e eze nāgabiga, na onye ahu tikuru eze nkpu: ọ si, Orù-gi puru ba n'etiti agha; ma, le, otù nwoke wezugara onwe-ya, me ka otù nwoke biakutem, ọ si, Debe nwoke a: ọ buru na ele anya ya ma-ọli ma ahughi ya, ndu-gi gāla-kwa-ra ndu-ya, ma-ọbu na i gākwu talent ọla-ọcha. 40 O rue, mb͕e orù-gi nēme ihe n'otù ebe na ebe ọzọ, na ahughm onye ahu. Eze Israel we si ya, Otú a ka ikpé-gi si di; gi onwe-gi ekwubìwo ya. 41 O we me ngwa, wezuga ákwà-ike-n'isi n'anya-ya abua; eze Israel we mata ya na onye sitere na ndi-amuma ka ọ bu. 42 Ọ si ya, Otú a ka Jehova siri, N'ihi na i zilagawo nwoke ahu ka ọ pua n'aka-gi, bú onye M'wezugara ka ebibie ya, ndu-gi gāla-kwa-ra ndu-ya, ndi-gi gāla-kwa-ra ndi-ya. 43 Eze Israel we la n'ulo-ya n'obi arọ́ na nb͕aru-iru, o we ba na Sameria.

1 Ndi-Eze 21

1 O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na Nebot, bú onye Jezreel, nwere ubi-vine, nke di na Jezreel, n'akuku ulo uku Ehab, bú eze Sameria. 2 Ehab we gwa Nebot okwu, si, Nyem ubi-vine-gi, ka o we burum ubi ab͕ara ogige ebe anāku akwukwọ nri, n'ihi na nke ahu di nso n'akuku ulom; ka m'nye kwa gi ubi-vine di nma kari ya n'ọnọdu ya: ma ọ buru na ọ di nma n'anya-gi, ka m'nye gi ego ruru ọnu-ahia-ya. 3 Nebot we si Ehab, Ya burum ihe-árú sitere na Jehova, bú inye gi ihe-nketa nnam-hà. 4 Ehab we ba n'ulo-ya n'obi arọ́ na nb͕aru-iru, n'ihi okwu nke Nebot, bú onye Jezreel, gwara ya: n'ihi na ọ siri, M'gaghi-enye gi ihe-nketa nnam-hà. O we dina n'ihe-ndina-ya, chigharia iru-ya, o righi kwa nri. 5 Jezebel, bú nwunye-ya, we biakute ya, gwa ya okwu, si, Gini me-kwa-ra mọ-gi di arọ́, i nērighi kwa nri? 6 Ọ si ya, N'ihi na agwaram Nebot, bú onye Jezreel, okwu, si ya, Nyem ubi-vine-gi n'ego; ma-ọbu, ọ buru na ọ tọ gi onwe-gi utọ, ka m'nye gi ubi-vine ọzọ n'ọnọdu ya: o we si, M'gaghi-enye gi ubi-vine nkem. 7 Jezebel, bú nwunye-ya, si ya, Ọ̀ bughi gi onwe-gi bu eze nāchi Israel ub͕u a? bilie, rie nri, ka obi-gi di nma: mu onwem gēnye gi ubi-vine Nebot, bú onye Jezreel. 8 O we de akwukwọ n'aha Ehab, were nb͕a-aka-akàrà-ya ka ha, zigara ndi-okenye akwukwọ ahu, ziga-kwa-ra ndi amara aha-ha ndi nọ n'obodo-ya, ndi ha na Nebot bi. 9 O we de n'akwukwọ ahu, si, Kpọsanu obu-bu-ọnu, me ka Nebot nọdu n'isi ọnọdu n'etiti ndi Israel: 10 me-kwa-nu ka ndikom abua, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, nọdu n'iru ya, ka ha b͕a kwa àmà megide ya, si, I b͕akutere Chineke na eze azu. Me-kwa-nu ka ọ pua, werenu nkume tub͕ue ya, ka ọ nwua. 11 Ndikom obodo-ya, bú ndi-okenye na ndi amara aha-ha ndi bi n'obodo-ya, we me dika Jezebel zitere ha ozi, dika edere ya n'akwukwọ nke o zitere ha. 12 Ha kpọsara obubu-ọnu, me ka Nebot nọdu n'isi ọnọdu n'etiti ndi Israel. 13 Ndikom abua ahu, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, we bata, nọdu n'iru ya: ndikom ahu ndi jọb͕uru onwe-ha we b͕a àmà megide ya, bú Nebot, n'iru ndi Israel, si, Nebot b͕akutere Chineke na eze azu. Ha we me ka ọ pua rue azu obodo, ha were nkume tub͕ue ya, o we nwua. 14 Ha we zigara Jezebel ozi, si, Atub͕uwo Nebot na nkume, ọ nwuwo kwa. 15 O rue, mb͕e Jezebel nuru na atub͕uwo Nebot na nkume, na ọ nwuwo kwa, na Jezebel siri Ehab, Bilie, nweta ubi-vine Nebot, bú onye Jezreel, nke ọ juru inye gi n'ego: n'ihi na Nebot adighi ndu, kama ọ nwuwo. 16 O rue, mb͕e Ehab nuru na Nebot anwuwo, na Ehab biliri iridaru ubi-vine Nebot, bú onye Jezreel, inweta ya. 17 Okwu Jehova we rue Elaija, bú onye Tisbe, nti, si, 18 Bilie, ridata izute Ehab, bú eze Israel, onye bi na Sameria; le, ọ nọ n'ubi-vine Nebot, ebe ọ ridara inweta ya. 19 Ma i gāgwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova siri, Ì b͕uwo ọchu, nweta kwa? I gāgwa kwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova siri, N'ebe nkita rachara ọbara Nebot ka nkita gāracha ọbara-gi, ọbuná nke gi onwe-gi. 20 Ehab we si Elaija, Ì chọtawom, onye-irom? Ọ si, Achọtawom i: n'ihi na i rewo onwe-gi ime ihe jọrọ njọ n'anya Jehova. 21 Le, M'nēme ka ihe ọjọ bakute gi, M'gēkpochapu ndi-gi fọduru, M'gēbipu kwa n'aru Ehab nwa-nwoke ọ bula, na onye eb͕ochiri eb͕ochi na onye arapuru arapu n'Israel, ka Jehova kwuru: 22 M'gēme kwa ulo-gi ka ọ di ka ulo Jeroboam nwa Nebat, ka ọ di kwa ka ulo Beasha nwa Ahaija, n'ihi nkpasu-iwe nke i ji kpasum iwe, me kwa ka Israel mehie. 23 Ọzọ kwa, Jehova kwuru okwu bayere Jezebel, si, Nkita gēri Jezebel n'ékpè Jezreel. 24 Onye nke Ehab nke nwuru anwu n'obodo, nkita gēri ya; onye nke nwuru anwu n'ọhia, anu-ufe nke elu-igwe gēri kwa ya. 25 (Otú ọ di, ọ dighi onye di ka Ehab, onye rere onwe-ya ime ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, onye Jezebel, bú nwunye-ya, rafuru. 26 Ọ we me ihe-árú nke-uku n'ijeso arusi di iche iche, dika ihe nile si di nke ndi-Amorait mere, ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel. ) 27 O rue, mb͕e Ehab nuru okwu ndia, na ọ dọwara uwe-ya nile, tukwasi ákwà-nkpe n'anu-aru-ya, bue ọnu, dina n'ákwà-nkpe, jegharia nwayọ. 28 Okwu Jehova we rue Elaija, bú onye Tisbe, nti, si, 29 Ì huwo na Ehab ewedawo onwe-ya n'ala n'irum? n'ihi na o wedawo onwe-ya n'ala n'irum, M'gaghi-eme ka ihe ọjọ ahu bia n'ubọchi-ya: ọ bu n'ubọchi nwa-ya ka M'gēme ka ihe ọjọ ahu biakwasi ulo-ya.

1 Ndi-Eze 22

1 Ha we nọdu arọ atọ agha adighi n'etiti Siria na Israel. 2 O rue, n'arọ nke-atọ, na Jehoshafat, bú eze Juda, ridakuru eze Israel. 3 Eze Israel we si ndi-orù-ya, Ùnu mara na ọ bu ayi nwe Remot-gilead, ma ayi onwe-ayi nāb͕a nkiti, ghara inaputa ya n'aka eze Siria? 4 Ọ si Jehoshafat, Ì gēsorom je agha na Remot-gilead? Jehoshafat we si eze Israel, Dika m'di, otú a ka i di; dika ndim di, otú a ka ndi-gi di; dika inyinyam di, otú a ka inyinya-gi di. 5 Jehoshafat we si eze Israel, Biko, buru uzo ju ase okwu Jehova. 6 Eze Israel we chikọta ndi-amuma, ra ka nnù ndikom, ọ si ha, M'gēje imegide Remot-gilead ibu agha, ma-ọbu m'gārapu? Ha we si, Rigo; Onye-nwe-ayi gēnye kwa ya n'aka eze. 7 Jehoshafat we si, Ọ̀ dighi onye-amuma Jehova nọ n'ebe a tiyere ndia, ka ayi we jua ase n'aka-ya? 8 Eze Israel we si Jehoshafat, Otù nwoke ọzọ di kwa iju Jehova ase n'aka-ya, bú Maikaia nwa Imla: ma mu onwem kpọrọ ya asì; n'ihi na ọ dighi-ebu amuma ezi ihe bayerem, kama ihe ọjọ. Jehoshafat we si, Ka eze ghara ikwu otú a. 9 Eze Israel we kpọ otù onye nēje ozi, si, Me ka Maikaia nwa Imla bia ọsọsọ. 10 Ma eze Israel na Jehoshafat, bú eze Juda, nānọkwasi, nwoke ọ bula n'oche-eze-ya, yiri uwe-ha, n'ebe-nzọcha-ọka n'oghere ọnu-uzọ-ama Sameria; ndi-amuma nile nēbu kwa amuma n'iru ha. 11 Zedekaia nwa Keneana we mere onwe-ya mpi ígwè, si, Otú a ka Jehova siri, Ndia ka i gēji sọ Siria, rue mb͕e agēme ka ha gwusia. 12 Ndi-amuma nile nēbu kwa amuma otú a, si, Rigorue Remot-gilead, ka ihe ga-kwa-ra gi nke-ọma: Jehova enyewo kwa ya n'aka eze. 13 Ma onye-ozi ahu nke jere ikpọ Maikaia gwara ya okwu, si, Biko, le, okwu nile nke ndi-amuma, dika otù ọnu, nēkwuru eze ezi ihe: biko, ka okwu-gi di ka okwu otù onye nime ha, gi kwu kwa ezi ihe. 14 Maikaia we si, Jehova nādi ndu, n'ezie ihe Jehova gāsim, nke ahu ka m'gēkwu. 15 O we biakute eze. Eze we si ya, Maikaia, àyi gējeru Remot-gilead ibu agha, ma-ọbu àyi gārapu? Ọ si ya, Rigo, ka ihe ga-kwa-ra gi nke-ọma; Jehova enyewo kwa ya n'aka eze. 16 Eze we si ya, Ùb͕ò ole ka mu onwem ganāb͕a gi iyi ka i ghara igwam ihe ọ bula ma-ọbughi ezi-okwu n'aha Jehova? 17 Ọ si, Ahurum Israel nile ka ha b͕asaworo n'ugwu, dika ìgwè aturu nēnweghi onye-ọzùzù: Jehova we si, Ọ dighi onye nwe ndia; ka ha laghachi, nwoke ọ bula n'ulo-ya n'udo. 18 Eze Israel we si Jehoshafat, Àsighm i na ọ gaghi-ebu amuma ezi ihe bayerem, kama ihe ọjọ? 19 Ọ si, N'ihi nka nuru okwu Jehova: ahurum Jehova ka Ọ nānọkwasi n'oche-eze-Ya, na usu-ndi-agha nke elu-igwe nile ka ha nēguzo n'akuku Ya n'aka-nri-Ya na n'aka-ekpe-Ya. 20 Jehova we si, Ònye gārafu Ehab, ka o we rigo, da na Remot-gilead? Ọtù onye we si otú a; onye ọzọ si-kwa-ra otú a. 21 Mọ ahu we puta, guzo n'iru Jehova, si, Mu onwem gārafu ya. 22 Jehova we si ya, Gini ka i gēji? Ọ si, M'gāpu, buru mọ okwu-ugha n'ọnu ndi-amuma-ya nile. Ọ si, I gārafu ya, i gēnwe kwa ike: pua, me otú a. 23 Ma ub͕u a, le, Jehova etiyewo mọ okwu-ugha n'ọnu ndi-amuma-gi ndia nile; Jehova ekwuwo kwa ihe ọjọ bayere gi. 24 Zedekaia nwa Keneana we biarue nso, tie Maikaia aka na ǹtì, si, Òle uzọ Mọ Jehova siri n'ebe m'nọ gabiga igwa gi okwu? 25 Maikaia we si, Le, i ganāhu n'ubọchi ahu, mb͕e i gābà n'ime-ulo nke di n'ime-ulo izo onwe-gi. 26 Eze Israel we si, Kuru Maikaia, me ka ọ laghachikuru Emon, bú onye-isi obodo, laghachikuru kwa Joash, bú nwa eze; 27 Igāsi kwa, Otú a ka eze siri, Tiyenu onye a n'ulo-nkpọrọ, me ka o rie nri nmeb͕u, ṅu kwa miri nmeb͕u, rue mb͕e m'gābia n'udo. 28 Maikaia we si, Ọ buru na i laghachi ma-ọli n'udo, Jehova ekwughi okwu n'ọnum. Ọ si, Nurunu, ndi nile n'uwa, unu nile. 29 Eze Israel na Jehoshafat, bú eze Juda, we rigorue Remot-gilead. 30 Eze Israel we si Jehoshafat, M'gēnwoghari onwem, ba n'agha; ma gi onwe-gi yikwasi uwe-gi. Eze Israel we nwogharia onwe-ya, ba n'agha. 31 Ma eze Siria nyere orú ndi-isi na iri na abua nke ub͕ọ-ala o nwere iwu, si, Unu ebusola onye ntà ma-ọbu onye uku agha, kama ọ bu eze Israel, nání ya. 32 O rue, mb͕e ndi-isi ub͕ọ-ala huru Jehoshafat, na ha onwe-ha siri, N'ezie eze Israel ka ọ bu; ha we wezuga onwe-ha ibuso ya agha: Jehoshafat we tie nkpu. 33 O rue, mb͕e ndi-isi ub͕ọ-ala huru na ya onwe-ya abughi eze Israel, ha we si n'iso ya laghachi. 34 Ma otù nwoke dọrọ uta-ya nāmaghi onye ọ bu, we b͕ata eze Israel n'etiti njikọ ihe-agha-ya na uwe-agha-ya: o we si onye-ub͕ọ-ala-ya, Chigharia aka-gi, me ka m'si n'ọmuma-ulo-ikwū pua; n'ihi na ọria nāriam. 35 Agha we la elu n'ubọchi ahu: ewe me ka eze guzogide n'ub͕ọ-ala-ya imegide Siria, o we nwua n'anyasi: ọbara ebe ab͕aruru ya aru we b͕apu ba n'etiti ub͕ọ-ala-ya. 36 Iti-nkpu we gazue n'ọmuma-ulo-ikwū mb͕e anyanwu nāda, si, Nwoke ọ bula, ya la n'obodo-ya, nwoke ọ bula, ya la n'ala-ya. 37 Eze we nwua, ewe bubata ya na Sameria; ha we lìe eze na Sameria. 38 Ewe ṅachapu ub͕ọ-ala-ya n'akuku ọdọ-miri Sameria; nkita we racha ọbara-ya; (ma ndinyom nākwa iko sara aru-ha n'ebe ahu; ) dika okwu Jehova si di nke O kwuru. 39 Ma okwu Ehab nile nke fọduru, na ihe nile ọ mere, na ulo ọdu nke o wuru, na obodo nile nke o wuru, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel? 40 Ehab we so nna-ya-hà dina n'ọnwu; Ehazaia, bú nwa-ya, we buru eze n'ọnọdu ya. 41 Jehoshafat nwa Esa malitere ibu eze Juda n'arọ nke-anọ nke Ehab, bú eze Israel. 42 Jehoshafat b͕ara orú arọ na iri na ise mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze orú arọ na ise na Jerusalem. Aha nne-ya bu Azuba nwa-nwayi Shilhi. 43 O jere ije n'uzọ Esa, bú nna-ya; o sighi nime ya wezuga onwe-ya, nēme ihe ziri ezi n'anya Jehova: nání na ewezugaghi ebe di elu; ndi Israel nọ nāchu àjà nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe di elu nile. 44 Jehoshafat me-kwa-ra ka ya na eze Israel di n'udo. 45 Ma okwu Jehoshafat nile nke fọduru, na ihe idi-ike-ya nke o mere, na otú o buru agha, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda? 46 Ọzọ, ndi fọduru n'etiti ndi edoro nsọ ikwa iko, bú ndi fọduru n'ubọchi Esa nna-ya, o kpochapuru ha n'ala. 47 Ma eze adighi n'Edom: onye edoro onye-isi bu eze. 48 Jehoshafat mere ub͕ọ Tashish ijeru Ofia ibute ọla-edo: ma ha ejeghi; n'ihi na etiwara ub͕ọ ahu n'Ezion-geba. 49 Mb͕e ahu Ehazaia nwa Ehab siri Jehoshafat, Ka ndi-orùm soro ndi-orù-gi je n'ub͕ọ-gi. Ma Jehoshafat ekweghi. 50 Jehoshafat we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Devid nna-ya: Jehoram nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya. 51 Ehazaia nwa Ehab malitere ibu eze Israel nime Sameria n'arọ nke-iri-na-asa nke Jehoshafat, bú eze Juda, o we buru eze Israel arọ abua. 52 O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, je kwa ije n'uzọ nna-ya, na n'uzọ nne-ya, na n'uzọ Jeroboam nwa Nebat, nke o ji me ka Israel mehie. 53 O fè-kwa-ra Beal òfùfè, kpọ isi ala nye ya, we kpasue Jehova, bú Chineke Israel, iwe, dika ihe nile si di nke nna-ya mere.

2 Ndi-Eze 1

1 Moab we jehie megide Israel mb͕e ọnwu Ehab gasiri. 2 Ehazaia we dapu n'ihe-ọkpukpa window nke ime-ulo-elu-ya nke di na Sameria, o we ria ọria: o ziga ndi-ozi, si ha, Jenu, jua Beal-zebub, bú chi Ekron, ase ma m'gādiri ndu n'ọria nka. 3 Ma mọ-ozi Jehova gwara Elaija, bú onye Tisbe, okwu, si, Bilie, rigo izute ndi-ozi eze Sameria, gwa ha okwu, si, Ọ̀ bu n'ihi na ọ dighi Chineke di n'Israel, na unu onwe-unu nēje iju Beal-zebub, bú chi Ekron, ase? 4 Ma n'ihi nka otú a ka Jehova siri, Ihe-ndina ahu ebe i rigoro, i gaghi-esi na ya rida, kama i ghaghi inwu. Elaija we la. 5 Ndi-ozi ahu we laghachikuru ya, ọ si ha, Gini bu nka na unu laghachiworo? 6 Ha si ya, Otù nwoke rigotara izute ayi, ọ si ayi, Jenu, laghachikuru eze nke zìri unu, gwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova siri, Ọ̀ bu n'ihi na ọ dighi Chineke di n'Israel na gi onwe-gi nēziga iju Beal-zebub, bú chi Ekron, ase? n'ihi ya ihe-ndina ahu ebe i rigoworo, i gaghi-esi na ya rida, kama i ghaghi inwu. 7 Ọ si ha, Òle aha madu ọ bu, bú nwoke ahu nke rigoro izute unu, we gwa unu okwu ndia? 8 Ha si ya, Ọ bu nwoke nwere aji nke-uku, eke-kwa-ra ya ihe-ọkiké akpukpọ n'úkwù-ya. Ọ si, Elaija onye Tisbe ka ọ bu. 9 O we zigara ya onye-isi ọgu ndi-agha abua na iri, ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya. O we rigokuru ya: ma, le, ọ nānọdu n'elu ugwu. O we gwa ya okwu, si, Gi onye nke Chineke, Eze asiwo, Ridata. 10 Elaija we za, si onye-isi ọgu ndi-agha abua na iri ahu, Ọ buru na onye nke Chineke ka m'bu, ka ọku si n'elu-igwe ridata, ripia gi na ọgu ndi-agha abua na iri gi. Ọku we si n'elu-igwe ridata, ripia ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya. 11 O we ziga-kwa-ra ya onye-isi ọgu ndi-agha abua na iri ọzọ, ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya. Ọ za, si ya, Onye nke Chineke, otú a ka eze siworo, Ngwa ngwa, ridata. 12 Elaija we za, si ha, Ọ buru na onye nke Chineke ka m'bu, ka ọku si n'elu-igwe ridata, ripia gi na ọgu ndi-agha abua na iri gi. Ọku nke Chineke we si n'elu-igwe ridata, ripia ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya. 13 Ọ we ziga kwa onye-isi ọgu ndi-agha abua na iri nke-atọ, ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya. Onye-isi nke-atọ nke ọgu ndi-agha abua na iri we rigo, bia b͕ue ikperè-ya n'ala n'iru Elaija, riọ ya amara, si ya, Onye nke Chineke, biko, ka ndum, na ndu ọgu ndi-orù-gi abua na iri ndia, di oké ọnu-ahia n'anya-gi. 14 Le, ọku siri n'elu-igwe ridata, ripia ndi-isi abua mbu ahu nke ọgu ndi-agha abua na iri, ha na ọgu ndi-agha abua na iri ha: ma ub͕u a ka ndum di oké ọnu-ahia n'anya-gi. 15 Mọ-ozi nke Jehova we si Elaija, Soro ya rida: atula egwu ya. O we bilie, soro ya ridakuru eze. 16 O we gwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova siri, N'ihi na i zigawo ndi-ozi iju Beal-zebub, bú chi Ekron, ase, ọ̀ bu n'ihi na ọ dighi Chineke di n'Israel iju ase okwu-Ya? n'ihi ya ihe-ndina ahu ebe i rigoworo, i gaghi-esi na ya rida, kama i ghaghi inwu. 17 O we nwua, dika okwu Jehova si di nke Elaija kwuru. Jehoram we malite ibu eze n'ọnọdu ya n'arọ nke-abua nke Jehoram nwa Jehoshafat, bú eze Juda; n'ihi na o nweghi nwa-nwoke. 18 Ma ihe Ehazaia nile nke fọduru nke o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel?

2 Ndi-Eze 2

1 O rue, mb͕e Jehova gaje ime ka Elaija rigorue elu-igwe n'oké ifufe, na Elaija siri na Gilgal je, ya na Elaisha. 2 Elaija we si Elaisha, Biko, nọdu n'ebe a; n'ihi na Jehova ezigawom ijeru Bet-el, Elaisha we si, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, m'gaghi-arapu gi ma-ọli. Ha we ridarue Bet-el. 3 Umu ndi-amuma ndi nọ na Bet-el we pukute Elaisha, si ya, Ì mawo na ta ka Jehova nēwepu onye-nwe-gi n'ibu onye-isi-gi? Ọ si, Mu onwem amawo kwa ya; b͕anu nkiti. 4 Elaija we si ya, Elaisha, biko, nọdu n'ebe a; n'ihi na Jehova ezigawom ijeru Jeriko. Ọ si, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, m'gaghi-arapu gi ma-ọli. Ha we biarue Jeriko. 5 Umu ndi-amuma ndi nọ na Jeriko we biarue Elaisha nso, si ya, Ì mawo na ta ka Jehova nēwepu onye-nwe-gi n'ibu onye-isi-gi? Ọ si, Mu onwem amawo kwa ya; b͕anu nkiti. 6 Elaija we si ya, Biko, nọdu n'ebe a; n'ihi na Jehova ezigawom ijeru Jọdan. Ọ si, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, m'gaghi-arapu gi ma-ọli. Ha abua we je. 7 Ọgu ndikom abua na iri n'etiti umu ndi-amuma je-kwa-ra, guzo na ncherita-iru ha n'ebe di anya: ha abua we guzo n'akuku Jọdan. 8 Elaija we chiri uwe - nwuda - ya, piakọta ya, tie miri ahu, ewe kera ya, otù uzọ ga n'otù akuku, otù uzọ ga n'akuku ọzọ, ha abua we gabiga n'ala-akọrọ. 9 O rue, mb͕e ha gabigasiri, na Elaija siri Elaisha, Riọ ihe m'gēmere gi, tutu ewepum n'ebe i nọ. Elaisha we si, Biko, ka òkè abua nke mọ-gi dikwasim. 10 Ọ si, I riọwo ihe siri ike: ma ọ buru na i hum mb͕e anēwepum n'ebe i nọ, ọ gādiri gi otú a; ma ọ buru na i hughm, ọ gaghi-adi otú a. 11 O rue na, mb͕e ha nọ nēje, nēje ije nēkwu kwa okwu, le, ub͕ọ-ala ọku na inyinya ọku, nke kewara ha abua; Elaija we rigorue elu-igwe n'oké ifufe. 12 Ma Elaisha nēle ya anya; ya onwe-ya nēti kwa nkpu, si, Nnam, nnam, ub͕ọ-ala Israel, na ndi-inyinya-ya! ma ọ hughi ya ọzọ: o we jide uwe nke aka ya, dọwa ha ibe abua. 13 Ọ chili kwa uwe-nwuda Elaija, nke danariri ya, ọ laghachi, guzo n'usọ Jọdan. 14 O we chiri uwe-nwuda Elaija, nke danariri ya, o we tie miri, si, Òle ebe Jehova nọ, bú Chineke Elaija? Ya onwe-ya kwa, o we tie miri, ewe kera ya otù uzọ ga n'otù akuku, otù uzọ ga n'akuku ọzọ; Elaisha we gabiga. 15 Umu ndi-amuma ndi nọ na Jeriko na ncherita-iru ya we hu ya, si, Mọ Elaija anọkwasiwo Elaisha. Ha we bia izute ya, ha we kpọrọ ya isi ala. 16 Ha we si ya, Biko, le, ọgu ndikom abua na iri, bú ndi-dìnkpà, nọ n'etiti ndi-orù-gi n'ebe a; biko, ka ha je, chọ onye-nwe-gi: eleghi anya Mọ nke Jehova eweliwo ya, tuda ya n'otù ugwu, ma-ọbu n'otù ndagwurugwu. Ọ si, Unu ezigala. 17 Ha we rugide ya rue mb͕e ihere mere ya, o we si, Ziganu. Ha we ziga ọgu ndikom abua na iri; ha we chọ ya ubọchi atọ, ma ha achọtaghi ya. 18 Ha we laghachikuru ya, ma ya onwe-ya nānọ na Jeriko; ọ si ha, Àsighm unu, Ejela? 19 Ndikom obodo ahu we si Elaisha, Biko, le, ọnọdu obodo a di nma, dika onye-nwem nāhu: ma miri-ya jọrọ njọ, ala nādighi-ekwe kwa ka ihe ka aka. 20 Ọ si, Wetaranum ọkwa ọhu, tiye-kwa-nu nnú nime ya. Ha we wetara ya. 21 Ọ pua je n'ebe miri si asuputa, o we tubà nnú n'ebe ahu, si, Otú a ka Jehova siri, Emewom ka miri a buru ihe inye ezi-ndu; ọnwu ma-ọbu ala nādighi-ekwe ka ihe ka aka agaghi-adi kwa ọzọ site n'ebe ahu. 22 Ewe me ka miri ahu buru ihe inye ezi-ndu rue ta, dika okwu Elaisha si di, nke o kwuru. 23 O si n'ebe ahu rigorue Bet-el: ma mb͕e ya onwe-ya nārigo n'uzọ, umu-okoro siri n'obodo puta, we kwa ya emò, si ya, Rigo, onye-isi-nkwọcha; rigo, onye-isi-nkwọcha. 24 Ọ le anya n'azu-ya, hu ha, kọcha ha n'aha Jehova. Nne anu-ọhia bear abua we si n'oké ọhia puta, dọka ọgu umu-okoro abua na abua n'etiti ha. 25 O si n'ebe ahu jerue ugwu Kamel, si kwa n'ebe ahu laghachi na Sameria.

2 Ndi-Eze 3

1 Ma Jehoram nwa Ehab malitere ibu eze Israel nime Sameria n'arọ nke-iri-na-asatọ nke Jehoshafat, bú eze Juda, o we buru eze arọ iri na abua. 2 O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova; nání na o meghi dika nna-ya, na dika nne-ya: o wezuga ogidi Beal nke nna-ya mere. 3 Otú ọ di, ọ rapara na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat, nke o ji me ka Israel mehie; o wezugaghi onwe-ya nime ya. 4 Ma Misha, bú eze Moab, bu onye-nwe ìgwè anu-ulo; o we tuara eze Israel utu aji nke orú nnù umu-aturu uzọ iri-na-abua na nnù iri, na nke orú nnù ebulu uzọ iri-na-abua na nnù iri. 5 O rue, mb͕e Ehab nwuru, na eze Moab jehiere megide eze Israel. 6 Eze, bú Jehoram, we si na Sameria pua n'ubọchi ahu, gukọta Israel nile. 7 O je kwa, zigara Jehoshafat, bú eze Juda, ozi, si, Eze Moab ejehiewo megidem: ì gēsorom jekuru Moab ibu agha? Ọ si, M'gārigo: dika m'di, otú a ka i di; dika ndim di, otú a ka ndi-gi di; dika inyinyam di, otú a ka inyinya-gi di. 8 Ọ si, Òle nke bu uzọ ayi gēsi rigo? Ọ si, Uzọ ọzara Edom. 9 Eze Israel we je, ya na eze Juda, na eze Edom: ha we ga ije ubọchi asa buruburu: ma ọ dighi miri diri ọmuma-ulo-ikwū ahu, ma ọbu nke diri anu-ulo nke ha chiri je. 10 Eze Israel we si, Ewó! n'ihi na Jehova akpọwo eze atọ ndia inye ha n'aka Moab. 11 Jehoshafat we si, Ọ̀ dighi onye-amuma Jehova nọ ebe a, ka ayi we jua Jehova ase site n'aka-ya? Otù nime ndi-orù eze Israel we za, si, Elaisha nwa Shefat nọ ebe a, onye wukwasiri miri n'aka Elaija. 12 Jehoshafat we si, Okwu Jehova di n'ebe ọ nọ. Eze Israel na Jehoshafat na eze Edom we ridakuru ya. 13 Elaisha we si eze Israel, Gini ka mu na gi nwekọrọ? jekuru ndi-amuma nna-gi, jekuru kwa ndi-amuma nne-gi. Eze Israel we si ya, É-è: n'ihi na Jehova akpọwo eze atọ ndia inye ha n'aka Moab. 14 Elaisha we si, Jehova nke usu nile nke ndi-agha nādi ndu, Onye m'guzoworo n'iru Ya, n'ezie, ọ buru na ahughm Jehoshafat, bú eze Juda, iru-ọma, m'gaghi-elegide anya n'ebe i nọ ma-ọli, m'gaghi-ahu kwa gi anya ma-ọli. 15 Ma ub͕u a kutaranum ọkpọ-ubọ. O rue, mb͕e ọkpọ-ubọ ahu nākpọ, na aka Jehova di n'aru ya. 16 Ọ si, Otú a ka Jehova siri, Me ndagwurugwu a ka ọ buru olùlù olùlù. 17 N'ihi na otú a ka Jehova siri, Unu agaghi-ahu ifufe, unu agaghi-ahu kwa oké miri-ozuzo, ma ndagwurugwu ahu gējuputa na miri: unu gāṅu kwa, unu onwe-unu, na anu-ulo-unu, na anumanu-unu nile. 18 Ma nka di nfe n'anya Jehova: Ọ gēnye kwa Moab n'aka-unu. 19 Unu gētib͕u kwa obodo ọ bula ewusiri ike, na obodo ọ bula kachasi nma, unu gēme kwa ka ezi osisi ọ bula da, unu gēkpochi kwa isi-iyi miri nile, were kwa nkume mebie ezi òkè ala-ubi ọ bula. 20 O rue n'ututu, na, mb͕e anēsure onyinye-inata-iru-ọma, le, miri nēsi n'uzọ Edom bia, ala we juputa na miri. 21 Moab nile we nu na ndi-eze ahu arigotawo ibuso ha agha, ha we kpọkọta onwe-ha, site n'onye ọ bula nke nēke onwe-ya ihe-ọkiké agha n'úkwù, we rigorue ndi bu okenye, ha we guzo n'ókè-ala-ha. 22 Ha we bilie n'isi-ututu, ma anyanwu mukwasiri miri ahu, Moab we hu miri ahu na ncherita-iru ha ka ọ nācha ọbara dika ọbara: 23 ha we si, Nka bu ọbara; ekpochapuwo ndi-eze ahu nọ̄, ha etib͕uwo kwa, nwoke ọ bula ibe-ya: ma ub͕u a, Moab, kwatanu ihe-nkwata. 24 Ha biarue ọmuma-ulo-ikwū Israel, Israel we bilie, tib͕ue Moab, ha we si n'iru ha b͕alaga: ha we ba nime ya nētib͕u Moab. 25 Ha we tipia obodo nile ha; ha nātubà kwa, nwoke ọ bula nkume-ya, n'ezi òkè ala-ubi ọ bula, tujue ya; ha nēkpochi kwa isi-iyi miri nile, me ka ezi osisi nile da: rue mb͕e ọ bu nání na Kia-hareset ka emere ka nkume-ya fọdu; ma ndi-ọma-èbè b͕ara ya buruburu, tib͕ue ya. 26 Eze Moab we hu na agha ahu di ike kari ya, o we chiri nnù ndikom na ọgu iri-na-ise tiyere onwe-ya, bú ndi nāmiputa mma-agha, itiwaru eze Edom: 27 O we were ọkpara-ya, nke gābu eze n'ọnọdu ya, sure ya ọku n'elu mb͕idi, ka ọ buru àjà-nsure-ọku. Oké iwe we di megide Israel: ha we si n'ebe ọ nọ bulie ije, laghachi n'ala-ha.

2 Ndi-Eze 4

1 Ma otù nwayi n'etiti ndinyom umu ndi-amuma tikuru Elaisha nkpu, si, Orù-gi, bú dim, anwuwo: ma gi onwe-gi amawo na orù-gi nātu egwu Jehova: ma onye-nbinye-ego abiawo ichiri n'onwe-ya umum abua ka ha buru orù. 2 Elaisha we si ya, Gini ka m'gēmere gi? gosim; gini ka i nwere n'ulo? Ọ si, Ọ dighi ihe ọ bula orù-gi nwayi nwere n'ulo, ọ bu nání ite manu. 3 Ọ si, Je, riọtara onwe-gi ihe n'èzí n'aka ndi-ab͕ata-obi-gi nile, bú ihe ihe nādighi nime ha; ha abula ole-na-ole. 4 I gābà kwa n'ulo, mechibido onwe-gi, mechibido kwa umu-gi ndikom, uzọ, b͕aye manu di n'ite ahu n'ihe ahu nile, buzuga nke juru eju. 5 O we si n'ebe ọ nọ la, mechibido onwe-ya, mechibido kwa umu-ya ndikom, uzọ; ha onwe-ha nēbutere ya ihe ahu nso, ma ya onwe-ya nāb͕aye ab͕aye. 6 O rue, mb͕e ihe nile juru, na ọ siri nwa-ya, Buterem nso ihe ọzọ. Ọ si ya, Ọ dighi ihe ọzọ di. Manu ahu we kwusi. 7 O we bia, gosi onye nke Chineke. Ọ si, Je, re manu ahu, kwua ugwọ-gi, gi onwe-gi na umu-gi ndikom were nke fọduru di ndu. 8 Ubọchi we rue, na Elaisha gabigara rue Shunem, ma otù nwayi uku nọ n'ebe ahu; o rugide ya ka o rie nri. O rue, mb͕e ọ bula ọ nāgabiga, na o wezugara onwe-ya ba n'ebe ahu iri nri. 9 Nwayi ahu we si di-ya, Biko, le, amawom na onye di nsọ nke Chineke ka ọ bu, bú onye a nagabiga n'akuku ayi mb͕e nile. 10 Biko, ka ayi me ime-ulo-elu ntà nke mb͕idi; ka ayi dọba-kwa-ra ya n'ebe ahu ihe-ndina, na table, na oche, na ihe-idọba-oriọna: o gēru kwa, mb͕e ọ biakutere ayi, na ọ gēwezuga onwe-ya ba n'ebe ahu. 11 Ubọchi we rue, na ọ biara n'ebe ahu, wezuga onwe-ya ba n'ime-ulo-elu ahu, dina n'ebe ahu. 12 Ọ si Gihezi, bú nwa-okorọbia-ya, Kpọ nwayi Shunem nka. O we kpọ ya, o we guzo n'iru ya. 13 Elaisha we si Gihezi, Biko, si ya, Le, i werewo ncheb͕u a nile cheb͕u onwe-gi bayere ayi; gini ka agēmere gi? ọ̀ bu igwa eze okwu bayere gi, ma-ọbu igwa onye-isi usu-ndi-agha? Ọ si, N'etiti ndim ka mu onwem nēbi. 14 Ọ si, Gini kwa ka agēmere ya? Gihezi we si, N'ezie ọ nweghi nwa-nwoke, di-ya aghọwo kwa agadi. 15 Ọ si, Kpọ ya. O we kpọ ya, nwayi ahu we guzo n'ọnu-uzọ. 16 Ọ si, Na mb͕e nka akara àkà, dika mb͕e a aka-nile, gi onwe-gi ganāb͕aku nwa-nwoke. Ọ si, É-è, onye-nwem, gi onye nke Chineke, agwala orù-gi nwayi okwu-ugha. 17 Nwayi ahu we turu ime, mua nwa-nwoke na mb͕e ahu akara àkà, dika mb͕e ahu aka-nile, otú Elaisha gwara ya. 18 Nwata ahu we toputa, ubọchi we rue, na ọ pukuru nna-ya jekuru ndi nēbì ọka. 19 Ọ si nna-ya, Isim, isim. O we si nwa-okorọbia-ya, Kuru ya bakuru nne-ya. 20 O kuru ya, me ka ọ biakute nne-ya, ọ nọkwasi n'ikperè nne-ya rue etiti-ehihie, we nwua. 21 Ọ rigo, tọb͕ọ ya n'ihe-ndina onye nke Chineke ahu, mechibido ya uzọ, pua. 22 Ọ kpọ di-ya, si, Biko, ziterem otù nime umu-okorọbia, na otù nime nne-inyinya-ibu, ka m'we b͕akuru onye nke Chineke, lata kwa. 23 Ọ si, Gini mere gi onwe-gi nējekuru ya ta? ọ bughi ọnwa ọhu, ọ bughi kwa ubọchi-izu-ike. Ọ si, Udo. 24 O we jikwa inyinya-ibu, si nwa-okorọbia-ya, Nēdu, nēje kwa; eb͕ochilaram inyinya-ibu n'ibum b͕a ọsọ, ma ọ buru na asighm i. 25 O we je, biakute onye nke Chineke ahu, rue ugwu Kamel. O rue, mb͕e onye nke Chineke huru ya site na ncherita-iru ya, na ọ siri Gihezi, bú nwa-okorọbia-ya, Le, nwayi Shunem ahu: 26 biko, b͕a ọsọ izute ya ub͕u a, si ya, Ì nọ n'udo? di-gi, ọ̀ nọ n'udo? nwa-gi, ọ̀ nọ n'udo? Ọ si, Ayi nọ n'udo. 27 O we biakute onye nke Chineke rue ugwu ahu, jide ya n'ukwu-ya abua. Gihezi we biarue nso inupu ya; ma onye nke Chineke siri, Ra ya aka: n'ihi na nkpuru-obi-ya di ilu nime ya; ma Jehova ezonariwom ya, O gosighkwam ya. 28 O we si, Àriọrọm nwa-nwoke n'aka onye-nwem? àsighm, Arafulam? 29 O we si Gihezi, Ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi, were kwa nkpa-n'akam n'aka-gi, je: mb͕e i zutere nwoke ọ bula, ekelela ya; mb͕e nwoke ọ bula gēkele gi, azala ya: tukwasi nkpa-n'akam n'iru nwa-okoro ahu. 30 Nne nwa-okoro ahu we si, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, m'gaghi-arapu gi ma-ọli. O we bilie, jeso ya. 31 Gihezi we gabiga n'iru ha, tukwasi nkpa-n'aka ahu n'iru nwa-okoro ahu; ma ọ dighi olu di, ọ dighi kwa ọṅuṅa-nti di. O we jeghachi izute ya, gosi ya, si, Nwa-okoro ahu etetaghi. 32 Elaisha we bata n'ulo ahu, ma, le, nwa-okoro ahu anwuwo, atọb͕ọ-kwa-ra ya n'ihe-ndina-ya. 33 O we ba, mechibido ha abua uzọ kpere Jehova. 34 Ọ rigo, dina n'elu nwata ahu, tukwasi ọnu-ya n'ọnu-ya, na anya-ya abua n'anya-ya abua, na ọbu-aka-ya abua n'ọbu-aka-ya abua, ruru ala n'elu ya: anu-aru nwata ahu we di ọku. 35 O we biaghachi, jegharia iru na azu n'ulo otù ub͕ò; ọ rigo, ruru kwa n'elu ya: nwa-okoro ahu we ze uzere rue ub͕ò asa, nwa-okoro we saghe anya-ya abua. 36 Ọ kpọ Gihezi, si, Kpọ nwayi Shunem nka. Ọ kpọ ya. Nwayi ahu we bakute ya, ọ si, Kuru nwa-gi. 37 O we ba nime, da n'ala n'ukwu-ya, kpọ isi ala, kuru nwa-ya, pua. 38 Ma Elaisha biaghachiri rue Gilgal: ma oké unwu di n'ala ahu; umu ndi-amuma nānọdu kwa ala n'iru ya: o we si nwa-okorọbia-ya, Tukwasi ite uku n'ọku, siere umu ndi-amuma ofé. 39 Otù onye we pua ba n'ọhia ichikọta akwukwọ nri, ọ huta osisi vine ọhia, chikọta afufa-ọhia nime ya nju uwe-ya, bia, biye ha n'ite ofé: n'ihi na ha amaghi ha. 40 Ha we wuputara ndikom ahu, ka ha rie. O rue, mb͕e ha nēri ofé ahu, na ndi ahu tiri nkpu, si, Ọnwu di n'ite, gi onye nke Chineke. Ha apughi kwa iri ya. 41 O we si, Weta-kwa-nu utu ọka. O we tiye ya n'ite ahu, si, Wuputara ndi-ayi, ka ha we rie. Ihe ọjọ adighi kwa n'ite ahu. 42 Ma otù nwoke siri na Beal-shalisha bia, butere onye nke Chineke achicha nke nkpuru mbu, orú ob͕e achicha barley, na ọka nke ubi n'akpa-ya. Ọ we si, Nye ndi-ayi, ka ha we rie. 43 Onye nējere ya ozi we si, Gini, M'gēche nka n'iru ọgu ndikom ise? Ọ si, Nye ndi-ayi, ka ha we rie; n'ihi na otú a ka Jehova siri, Ha gēri, rifọ kwa. 44 O we che ya n'iru ha, ha we rie, rifọ kwa, dika okwu Jehova si di.

2 Ndi-Eze 5

1 Ma Neaman, bú onye-isi usu-ndi-agha eze Siria, bu nwoke di uku n'iru onye-nwe-ya, buru kwa onye anāhu iru-ọma, n'ihi na ọ bu n'aka-ya ka Jehova nyere Siria nzọputa: nwoke ahu bu kwa dike nke bu dìnkpà, ma ọ bu onye-ekpenta. 2 Ndi Siria apuwo nēje n'usu ndi nāpunara madu ihe, we si n'ala Israel dọta otù nwa-ob͕ọghọ ntà n'agha; o we nọ n'iru nwunye Neaman. 3 Ọ si nwayi-nwe-ya, Ọ gādim nọ̄ nma, ma asi na onye-nwem nọ n'iru onye-amuma nke nọ na Sameria! mb͕e ahu ọ gēme ka o si n'ekpenta-ya di ọcha soro ndi-ya zukọta. 4 Otù onye we ba, gosi onye-nwe-ya, si, Otú a na otú a ka nwa-ab͕ọghọ ahu nke sitere n'ala Israel kwuru. 5 Eze Siria we si, Je, ba, ka m'ziga-kwa-ra eze Israel akwukwọ. O we je, chiri n'aka-ya talent ọla-ọcha iri, na nnù ọla-edo iri-na-ise, na uwe nb͕anwe iri. 6 O were akwukwọ ahu biakute eze Israel, si, Ma ub͕u a, mb͕e akwukwọ a biakutere gi, le, ezìwom Neaman, bú orùm, biakute gi, ka i we me ka o si n'ekpenta-ya di ọcha soro ndi-ya zukọta. 7 O rue, mb͕e eze Israel guru akwukwọ ahu, na ọ dọwara uwe-ya nile, si, Ọ̀ bu Chineke ka m'bu, ime ka madu nwua na ime ka madu di ndu, na nwoke a nēziterem ozi ime ka nwoke si n'ekpenta-ya di ọcha soro ndi-ya zukọta? ma otú ọ di, biko, maranu hu kwa na ya onwe-ya nāchọ uzọ isi megidem. 8 O rue, mb͕e Elaisha bú onye nke Chineke, nuru na eze Israel dọwara uwe-ya nile, o we zigara eze ozi, si, N'ìhi gini ka i dọwara uwe-gi nile? biko, ka ọ biakutem, ọ gāmara kwa na onye-amuma di n'Israel. 9 Neaman we bia, ya na inyinya-ya nile na ub͕ọ-ala-ya, o guzo n'ọnu-uzọ ulo Elaisha nwere. 10 Elaisha we zigara ya onye-ozi, si, Je, sa aru ub͕ò asa nime Jọdan, anu-aru-gi gālaghachikute kwa gi, i gādi kwa ọcha. 11 Ma Neaman were iwe, laba, si, Le, m'siri, Ọ ghaghi ipukutem, guzo, kpọkue aha Jehova, bú Chineke-ya, fufe aka-ya n'elu ebe ahu, me ka onye-ekpenta di ọcha soro ndi-ya zukọta. 12 Abana na Fapa, bú osimiri Damaskọs, hà adighi nma kari miri Israel nile? #m'gaghi-asa aru nime ha, di ọcha? O we chigharia, laba n'ọnuma. 13 Ndi-orù-ya we biarue nso, gwa ya okwu, si, Nnam, asi na ọ bu ihe uku onye-amuma gwara gi me, ì gaghi-eme ya? ì gēsi kwa aṅa ghara ime ya mb͕e ọ siri gi, Sa aru, di kwa ọcha? 14 O we rida, suye onwe-ya nime Jọdan ub͕ò asa, dika okwu onye nke Chineke si di: anu-aru-ya we laghachi dika anu-aru nwa-okoro ntà, o we di ọcha. 15 O we laghachikute onye nke Chineke, ya onwe-ya na ọmuma-ulo-ikwū-ya nile, bia, guzo n'iru ya, si, Biko, le, amawom na ọ dighi Chineke di n'uwa nile, ọ bu nání n'Israel: ma ub͕u a, biko, nara ihe-ngọzi n'aka orù-gi. 16 Ọ si, Jehova nādi ndu, Onye m'guzoworo n'iru Ya, m'gaghi-anara ihe ọ bula ma-ọli. O we rugide ya inara ya; ma ọ juru aju. 17 Neaman we si, Ọ buru na i naghi, biko, ka enye orù-gi ibu ájá nke inyinya mule abua gēbu; n'ihi na orù-gi agaghi-emere chi ọzọ àjà-nsure-ọku ma-ọbu àjà ọzọ site n'ub͕u a, ma ọ bu náni Jehova. 18 Ka Jehova b͕aghara orù-gi ihe a; mb͕e onye-nwem nābà n'ulo Rimon ikpọ isi ala n'ebe ahu, mb͕e ya onwe-ya nādabere kwa n'akam, m'we kpọ isi ala n'ulo Rimon, mb͕e m'kpọrọ isi ala n'ulo Rimon, biko, ka Jehova b͕aghara orù-gi n'ihe a. 19 Ọ si ya, La n'udo. O we si n'ebe ọ nọ je n'uzọ-ya nwantī. 20 Ma Gihezi, bú nwa-okorọbia Elaisha onye nke Chineke, siri, Le, onye-nwem eb͕ochiwo onwe-ya n'ebe Neaman onye Siria nka nọ, n'ighara inara n'aka-ya ihe o wetara: Jehova nādi ndu, n'ezie m'gāb͕aso ya, nara ihe ufọdu n'aka-ya. 21 Gihezi we chuso Neaman. Neamam we hu otù onye nāb͕aso ya, o we si n'ub͕ọ-ala-ya rida izute ya, si, Ùdo di kwa? 22 Ọ si, Udo di. Onye-nwem ezitewom, si, Le, ọbuná ub͕u a umu-okorọbia abua nime umu ndi-amuma esiwo n'ugwu Efraim biakutem; biko, nye ha otù talent ọla-ọcha, na uwe nb͕anwe abua. 23 Neaman we si, Kwere, nara talent abua. O rugide ya, ke talent ọla-ọcha abua n'akpa abua, chiri uwe nb͕anwe abua, nye umu-okorọbia-ya abua; ha we būru ha ga n'iru ya. 24 Ọ biarue ugwu ntà ahu, nara ha n'aka-ha, tiye ha n ulo: o zilaga ndikom ahu, ha we la. 25 Ma ya onwe-ya bara nime, guzo n'akuku onye-nwe-ya. Elaisha we si ya, Òle ebe i si bia, Gihezi? Ọ si, Orù-gi ejeghi ebe ọ bula. 26 Ọ si ya, Òbim ejesoghi gi, mb͕e nwoke ahu siri n'ub͕ọ-ala-ya chigharia izute gi? ọ̀ bu mb͕e inara ego, na inara uwe, na ubi-olive na ubi-vine, na ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, na ndi-orù ndikom na ndinyom nēje ozi? 27 Ekpenta Neaman gārapara kwa n'aru gi, na n'aru nkpuru-gi rue mb͕e ebighi-ebi. Ọ we si n'iru ya pua, buru onye-ekpenta nēnwu dika snow.

2 Ndi-Eze 6

1 Umu ndi-amuma we si Elaisha, Biko, le, ebe ayi onwe-ayi nēbi n'iru gi adikara ayi nkpa. 2 Biko, ka ayi jerue Jọdan, si kwa n'ebe ahu were, nwoke ọ bula otù ntuhie, mere onwe-ayi otù ebe n'ebe ahu, ibiri n'ebe ahu. Ọ si, Jenu. 3 Otù onye we si, Biko, kwere, soro ndi-orù-gi je. Ọ si, Mu onwem gēje. 4 O we so ha je. Ha we biarue Jọdan, b͕utue osisi. 5 O rue, mb͕e otù onye nēb͕utu ntuhie-ya, na anyu-ike dabàra na miri: o we tie nkpu, si, Ewó, onye-nwem! nke ahu bu ihe ariọtara ariọta. 6 Onye nke Chineke we si, Òle ebe ọ dara? Ọ we me ka ọ hu ebe ahu. O we b͕utue otù osisi, tubà ya n'ebe ahu, me ka anyu-ike se n'elu miri. 7 O si, Weliere onwe-gi. O we setia aka-ya, were ya. 8 Ma eze Siria nēbuso Israel agha; o we me ka ndi-orù-ya dua ya ọdu, si, N'ebe di otú a otú a ka ọmuma-ulo-ikwūm gādi. 9 Onye nke Chineke we zigara eze Israel ozi, si, Lezie onwe-gi anya, ka i ghara igabiga ebe ahu; n'ihi na n'ebe ahu ka Siria nāridata. 10 Eze Israel we ziga ozi n'ebe ahu nke onye nke Chineke siri ya dọ kwa ya aka na nti bayere ya; ewe debe ya ndu n'ebe ahu, ọ bughi otù ub͕ò, ọ bughi kwa ub͕ò abua. 11 Ma obi eze Siria anọghi n'otù ebe n'ihi ihe a; o we kpọ ndi-orù-ya, si ha, Ùnu agaghi-egosim onye nime ayi diri eze Israel? 12 Otù onye nime ndi-orù-ya we si, É-è, onye-nwem eze: kama Elaisha, bú onye-amuma nke nọ n'Israel, o nēgosi eze Israel okwu nile nke i nēkwu n'ime-ulo-ndina-gi. 13 Ọ si, Jenu, hu ebe ya onwe-ya nọ, ka m'we ziga kuta ya. Ewe gosi ya, si, Le, ọ nọ na Dotan. 14 O we ziga inyinya na ub͕ọ-ala na oké usu-ndi-agha n'ebe ahu: ha we bia n'abali, je obodo ahu buruburu. 15 Onye nējere onye nke Chineke ozi we bilie n'isi-ututu, pua, ma, le, usu-ndi-agha nāb͕a obodo ahu buruburu, ha na inyinya na ub͕ọ-ala. Nwa-okorọbia-ya we si ya, Ewó, onye-nwem! àyi gēme aṅa? 16 Ọ si, Atula egwu: n'ihi na ndi ayi na ha nọ di ọtutu kari ndi ha na ha nọ. 17 Elaisha we kpe ekpere, si, Jehova, biko, saghe anya-ya abua, ka ọ we hu. Jehova we saghe anya nwa-okorọbia ahu; o we hu: ma, le, ugwu ahu juputara n'inyinya na ub͕ọ-ala ọku buruburu Elaisha. 18 Ha we ridakute ya, Elaisha we kpere Jehova, si, Biko, were ìsì tie mba nka. O we were ìsì tie ha dika okwu Elaisha si di. 19 Elaisha we si ha, Nka abughi uzọ, nka abughi kwa obodo; sonum je, m'gēme kwa ka unu jekuru nwoke ahu onye unu nāchọ. O we me ka ha je Sameria. 20 O rue, mb͕e ha bara na Sameria, na Elaisha siri, Jehova, saghe anya ndikom ndia, ka ha we hu. Jehova we saghe anya-la, ha we hu; ma, le, ha nọ n'etiti Sameria. 21 Eze Israel we si Elaisha, mb͕e ọ huru ha, Nnam, #m'gētib͕u ha? #m'gētib͕u ha? 22 Ọ si, Etib͕ula ha: ì gētib͕u ndi i wereworo mma-agha-gi, were kwa uta-gi, dọta n'agha? dọba nri na miri n'iru ha, ka ha we rie, ṅu kwa, lakuru onye-nwe-ha. 23 O we mere ha oké oriri: ha we rie, ṅu kwa, o we zilaga ha, ha we lakuru onye-nwe-ha. Ma usu ndi nāpunara madu ihe nke Siria abataghi ọzọ n'ala Israel. 24 O rue, mb͕e nka gasiri, na Ben-hedad, bú eze Siria, chikọtara ọmuma-ulo-ikwū-ya nile, rigo, nọchigide Sameria n'agha. 25 Oké unwu uku we di na Sameria: ma, le, ha nānọchigide ya n'agha, rue mb͕e anēre isi inyinya-ibu ọgu ọla-ọcha anọ na otù uzọ n'uzọ anọ nke otù kab ǹsí nduru ọla-ọcha ise. 26 O rue, mb͕e eze Israel nāgabiga n'elu mb͕idi, na otù nwayi tikuru ya nkpu, si, Zọputa, onye-nwem eze. 27 Ọ si, Ọ buru na Jehova azọputaghi gi, òle ebe m'gēsi zọputa gi? ọ̀ bu site n'ebe-nzọcha-ọka, ma-ọbu site n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine? 28 Eze we si ya, Gini nēme gi? Ọ si, Nwayi a sirim, Nye nwa-gi nwoke, ka ayi we rie ya ta, nwam nwoke ka ayi gēri kwa echi. 29 Ayi we sie nwam nwoke, rie ya: m'we si ya n'ubọchi soro ya, Nye nwa-gi nwoke, ka ayi we rie ya: ma o zowo nwa-ya nwoke. 30 O rue, mb͕e eze nuru okwu nile nke nwayi ahu, na ọ dọwara uwe-ya nile; (ma ya onwe-ya nāgabiga n'elu mb͕idi; ) ndi Israel we le anya, ma, le, ákwà-nkpe dikwasi n'anu-aru-ya n'okpuru uwe-ya. 31 O we si, Ka Chineke mem otú a, ka O me kwa ihe ọzọ otú a, ma ọ buru na isi Elaisha nwa Shefat gēguzo n'aru ya ta. 32 Ma Elaisha nānọdu n'ulo-ya, ndi-okenye nānọdu kwa n'ebe ọ nọ: eze we ziga otù nwoke site n'iru ya: ma tutu onye-ozi ahu abiakute ya, ya onwe-ya siri ndi-okenye, Ùnu ahuwo na nwa ob͕u-madu a ezitewo iwezuga isim? hunu, mb͕e onye-ozi ahu nābia, mechienu uzọ, were ibo-uzọ kwagide ya: òlu ukwu abua nke onye-nwe-ya adighi n'azu ya? 33 Mb͕e ọ nọ nākpayere ha uka, le, onye-ozi ahu nāridakuru ya: ọ si, Le, ihe ọjọ a sitere n'aka Jehova; gini mere m'nēle anya Jehova ọzọ?

2 Ndi-Eze 7

1 Elaisha we si, Nurunu okwu Jehova: otú a ka Jehova siri, Dika mb͕e a echi agēre otù mb͕é utu ọka flour otù shekel, na mb͕é barley abua otù shekel, n'ọnu-uzọ-ama Sameria. 2 Ọchi-agha ahu onye eze nwere, onye ọ nādabere n'aka-ya, we za onye nke Chineke, si, Le, ọ buru na Jehova eme window n'elu-igwe, ihe a, ọ̀ gādi? Ọ si, Le, i ganēwere anya-gi abua hu ya, ma i gaghi-eri nime ya. 3 Ma ndikom anọ, bú ndi-ekpenta, nọ n'oghere ọnu-uzọ-ama: ha we sirita, onwe-ha, Gini mere ayi onwe-ayi nānọdu n'ebe a rue mb͕e ayi nwuru? 4 Ọ buru na ayi asi, Ayi gābà n'obodo, oké unwu di kwa n'obodo, ayi gānwu kwa n'ebe ahu: ọ buru kwa na ayi anọdu n'ebe a, ayi gānwu kwa. Ma ub͕u a, bianu, ka ayi dabà n'ọmuma-ulo-ikwū Siria: ọ buru na ha edebe ayi ndu, ayi gādi ndu; ọ buru kwa na ha eme ka ayi nwua, ayi gānwu kwa. 5 Ha we bilie n'ururuchi, ibà n'ọmuma-ulo-ikwū Siria: ha we biarue nsọtu ọmuma-ulo-ikwū Siria, ma, le, ọ dighi nwoke nọ n'ebe ahu. 6 N'ihi na Onwe-nwe-ayi mere ọmuma-ulo-ikwū Siria ka ha nu olu ub͕ọ-ala, na olu inyinya, bú olu oké usu-ndi-agha: ha we sirita onwe-ha, Le, eze Israel egowo ndi-eze ndi Het, na ndi-eze Ijipt, imegide ayi, ibiakwasi ayi. 7 Ha we bilie, b͕alaga n'ururuchi, rapu ulo-ikwū nile ha, na inyinya nile ha, na inyinya-ibu nile ha, ọbuná ọmuma-ulo-ikwū-ha otú di, b͕alaga n'ihi ndu-ha. 8 Ndi-ekpenta ahu we biarue nsọtu ọmuma-ulo-ikwū, ba n'otù ulo-ikwū, rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, si n'ebe ahu chiri ọla-ọcha, na ọla-ebo, na uwe, je zo ha; ha we biaghachi, ba n'ulo-ikwū ọzọ, si n'ebe ahu chiri kwa ihe, je zo ha. 9 Ha we sirita onwe-ha, Ọ bughi ihe ziri ezi ka ayi onwe-ayi nēme: ubọchi ta, ubọchi ozi ọma ka ọ bu, ma ayi onwe-ayi nāb͕a nkiti: ọ buru na ayi echere rue ìhè ututu, ajọ omume-ayi gāchọputa ayi: ma ub͕u a bianu, ka ayi ba gosi ulo eze. 10 Ha we bia, kpọ onye-ọnu-uzọ-ama obodo òkù, gosi ha, si, Ayi bara n'ọmuma-ulo-ikwū Siria, ma, le, ọ dighi nwoke nọ n'ebe ahu, ọ dighi kwa olu madu di, ma inyinya elibere elibe, na inyinya-ibu elibere elibe, na ulo-ikwū otú ha di. 11 O we kpọ ndi-ọnu-uzọ-ama; ha we gosi ya ulo eze nime. 12 Eze we bilie n'abali, si ndi-orù-ya, Biko, ka m'gosi unu ihe Siria meworo ayi. Ha mara na agu nāgu ayi onwe-ayi, ha we si n'ọmuma-ulo-ikwū-ha pua izo onwe-ha n'ọhia, si, Mb͕e ha siri n'obodo puta, ayi gējide ha na ndu, ba n'obodo-ha. 13 Otù nime ndi-orù-ya we za, si, Biko, ka achiri inyinya ise nime inyinya fọduru, nke fọduru nime ya, (le, ha di ka ìgwè nile nke Israel nke fọduru nime ya; le, ha di ka ìgwè nile nke Israel ndi gwusiri agwusi: ) ka ayi ziga hu kwa. 14 Ha we chiri ub͕ọ-ala abua, ha na inyinya; eze we ziga ha iso ọmuma-ulo-ikwū Siria, si, Jenu, hu. 15 Ha we jeso ha rue Jọdan: ma, le, uzọ nile juputara n'uwe na ihe, nke ndi Siria tufuru n'ime-ngwa-ngwa-ha. Ndi-ozi we lata, gosi eze. 16 Ndi Israel we pua, luta ọmuma-ulo-ikwū Siria n'agha. Ewe re otù mb͕é utu ọka flour otù shekel, na mb͕é barley abua otù shekel, dika okwu Jehova si di. 17 Eze we me ka onye-isi-agha ahu, bú onye ọ nādabere n'aka-ya, lekọta ọnu-uzọ-ama: ndi Israel we zọkwasi ya ukwu n'ọnu-uzọ-ama, ọ nwua dika onye nke Chineke kwuru, onye kwuru mb͕e eze ridakuru ya. 18 O rue, dika onye nke chineke gwara eze okwu, si, Agēre mb͕é barley abua otù shekel, na otù mb͕é utu ọka flour otù shekel, dika mb͕è a echi, n'ọnu-uzọ-ama Sameria; 19 onye-isi-agha we za onye nke Chineke, si, Ma, le, ọ buru na Jehova eme window n'elu-igwe, ọ̀ gādi ka okwu a si di? Ọ si, Le, i ganēwere anya-gi abua hu ya, ma i gaghi-eri nime ya: 20 o we diri ya otú a; ndi Israel we zọkwasi ya ukwu n'ọnu-uzọ-ama, ọ nwua.

2 Ndi-Eze 8

1 Ma Elaisha gwara nwayi ahu okwu, bú onye o mere ka nwa-ya nwoke di ndu, si, Bilie, je, gi onwe-gi na ulo-gi, nọ dika ọbìa n'ebe ọ bula i gānọ dika ọbìa: n'ihi na Jehova akpọwo oké unwu ka ọ da: ọzọ kwa, ọ gābiakwasi ala arọ asa. 2 Nwayi ahu we bilie, me dika okwu onye nke Chineke si di: ọ we je, ya onwe-ya na ulo-ya, nọ dika ọbìa n'ala ndi Filistia arọ asa. 3 O rue, n'ọgwugwu arọ asa ahu, na nwayi ahu si n'ala ndi Filistia lata: ọ pua itiku eze nkpu bayere ulo-ya na ala-ya. 4 Ma eze nāgwa Gihezi, bú nwa-okorọbia onye nke Chineke, okwu, si, Biko, kọrọm akukọ ihe uku nile nke Elaisha meworo. 5 O rue na, mb͕e ya onwe-ya nākọrọ eze otú o mere ka onye nwuru anwu di ndu ọzọ, le, nwayi ahu, onye o mere ka nwa-ya nwoke di ndu ọzọ nētiku eze nkpu bayere ulo-ya, baye-kwa-ra ala-ya. Gihezi we si, Onye-nwem eze, nka bu nwayi ahu, nka bu kwa nwa-ya nwoke, onye Elaisha mere ka ọ di ndu ọzọ. 6 Eze we jua nwayi ahu, o we kọrọ ya akukọ ahu. Eze we nye ya otù onye nējere ya ozi, si, Nyeghachi ihe nile o nwere, na ihe-ọmume nile nke ubi site n'ubọchi ọ rapuru ala-ya, we rue ub͕u a. 7 Elaisha we biarue Damaskọs; ma Ben-hedad, bú eze Siria, nāria ọria; ewe gosi ya, si, Onye nke Chineke abiawo n'ebe a. 8 Eze we si Hazael, Were onyinye-inata-iru-ọma n'aka-gi, je izute onye nke Chineke, jua Jehova ase site n'aka-ya, si, M'gādiri ndu n'ọria nka? 9 Hazael we je izute ya, were onyinye-inata-iru-ọma n'aka-ya, bú ezi ihe nile nke Damaskọs, ibu ọgu camel abua gēbu, o we bia guzo n'iru ya, si, Nwa-gi, bú Ben-hedad eze Siria, ezìwom biakute gi, si, M'gādiri n'ọria nka? 10 Elaisha we si ya, Je, si ya, I ghaghi idiri ndu; ma Jehova emewo ka m'hu na ọ ghaghi inwu. 11 Ọ we legide ya anya, che ya iru, rue mb͕e ihere mere ya: onye nke Chineke we kwa ákwá. 12 Hazael we si, Gini mere onye-nwem nākwa ákwá? Ọ si, N'ihi na amawom ihe ọjọ nke i gēme umu Israel: i gēsu ebe nile ha ewusiri ike ọku, i gēwere kwa mma-agha b͕ue umu-okorobia-ha, i gātupia kwa umu-ha nāṅu ara, i gāb͕awa ndinyom-ha di ime afọ. 13 Hazael we si, Ma gini bu orù-gi, bú nkita nka, na ọ gēme ihe uku a? Elaisha we si, Jehova emewo ka m'hu na i gābu eze Siria. 14 O we si n'ebe Elaisha nọ la, biakute onye-nwe-ya; ọ si ya, Gini ka Elaisha siri gi? Ọ si, Ọ sirim na i ghaghi idiri ndu. 15 O rue, n'echi-ya, na ọ chiri ákwà-ob͕ub͕o, biaye na miri, b͕asa ya n'iru-ya, ọ we nwua: Hazael we buru eze n'ọnọdu ya. 16 Ma n'arọ nke-ise nke Joram nwa Ehab, bú eze Israel, mb͕e Jehoshafat bu kwa eze Juda, Jehoram nwa Jehoshafat, bú eze Juda, malitere ibu eze. 17 Orú arọ na iri na abua ka ọ b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ astọ na Jerusalem. 18 Ọ je ije n'uzọ ndi-eze Israel, dika ulo Ehab mere: n'ihi na ọ bu nwa-nwayi Ehab ka o nwere na nwunye: o we me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova. 19 Ma Jehova ekweghi ibibi Juda, n'ihi Devid, bú orù-Ya, dika Ọ siri ya na Ọ gēnye ya oriọna, nye kwa umu-ya, ubọchi nile. 20 N'ubọchi-ya ka Edom siri n'okpuru aka Juda jehie, mere onwe-ha eze. 21 Joram we gabiga rue Zaia, ya na ub͕ọ-ala-ya nile: o rue na o biliri n'abali, tib͕ue Edom ndi nāb͕a ya buruburu, ha na ndi-isi ub͕ọ-ala: ndi ahu we b͕alaga n'ulo-ikwū-ha. 22 Edom we si n'okpuru aka Juda jehie, rue ta. Mb͕e ahu ka Libna jehiere n'otù mb͕e ahu. 23 Ma okwu Joram nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda? 24 Joram we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Devid: Ehazaia, bú nwa-ya, we buru eze n'ọnọdu ya. 25 N'arọ nke-iri-na-abua nke Joram nwa Ehab, bú eze Israel, ka Ehazaia nwa Jehoram, bú eze Juda, malitere ibu eze. 26 Orú arọ na abua ka Ehazaia b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze otù arọ na Jerusalem. Ma aha nne-ya bu Atalaia nwa Ọmri, bú eze Israel. 27 O we je ije n'uzọ ulo Ehab, me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika ulo Ehab mere: n'ihi na nwa nwa ulo Ehab ka ọ bu. 28 O we soro Joram nwa Ehab ibuso Hazael, bú eze Siria, agha na Remot-gilead: ndi Siria we tib͕ue Joram. 29 Eze, bú Joram, we lata ka agwọ ya nime Jezreel na ntib͕u ndi Siria tib͕uru ya na Rema, mb͕e o nēbuso Hazael, bú eze Siria, agha. Ehazaia nwa Jehoram, bú eze Juda, we rida ihu Joram nwa Ehab nime Jezreel, n'ihi na ọ nāria ọria.

2 Ndi-Eze 9

1 Ma Elaisha, bú onye-amuma, kpọrọ otù onye nime umu ndi-amuma, si ya, Ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi, were karama manu a n'aka-gi, je Remot-gilead. 2 Mb͕e i biara ebe ahu, gi hu Jihu nwa Jehoshafat nwa Nimshi anya n'ebe ahu, ba nime, me ka o bilie site n'etiti umu-nne-ya, me kwa ka ọ ba n'ime-ulo di n'ime-ulo. 3 Gi were kwa karama manu ahu, wukwasi ya n'isi-ya, si, Otú a ka Jehova siri, Etewom i manu ibu eze Israel. Meghe kwa uzọ, b͕alaga, eche-kwa-la eche. 4 Nwa-okorọbia ahu, ọbuná nwa-okorọbia ahu, bú onye-amuma, we jerue Remot-gilead. 5 Ọ bia, ma, le, ndi-isi usu-ndi-agha nanọdu ala; ọ si, Enwerem okwu igwa gi, onye-isi. Jihu we si, Ọ̀ bu onye nime ayi nile? Ọ si, Ọ bu gi, onye-isi. 6 O bilie, ba n'ulo; ọ wukwasi manu ahu n'isi-ya, si ya, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Etewom i manu ibu eze ndi Jehova, bú Israel. 7 I gētib͕u kwa ulo Ehab, bú onye-nwe-gi, ka M'we bọ ọ́bọ̀ ọbara ndi-orùm, bú ndi-amuma, na ọbara ndi-orù nile nke Jehova, n'aka Jezebel. 8 Ulo nile nke Ehab gāla kwa n'iyì: M'gēbipu kwa n'aru Ehab nwa-nwoke ọ bula, na onye eb͕ochiri eb͕ochi na onye arapuru arapu n'Israel. 9 M'gēme kwa ulo Ehab ka ọ di ka ulo Jeroboam nwa Nebat, ka ọ di kwa ka ulo Beasha nwa Ahaija. 10 Nkita gēri kwa Jezebel n'òkè-ala-ubi Jezreel, ọ dighi kwa onye nēlì ya. O we meghe uzọ b͕alaga. 11 Jehu we pukute ndi-orù onye-nwe-ya: otù onye we si ya, Ùdo di kwa? gini mere onye a nke nāwi ara biakutere gi? Ọ si ha, Unu onwe-unu amawo nwoke ahu na nkpari-uka-ya. 12 Ha si, Ọ bu okwu-ugha; biko, gosi ayi. Ọ si, Otú a na otú a ka ọ gwaram, si, Otú a ka Jehova siri, Etewom i manu ibu eze Israel. 13 Ha we me ngwa, chiri, nwoke ọ bula uwe-ya, do ya n'okpuru ya n'elu ihe-nrigo, fùa opì-ike, si, Jihù bu eze. 14 Jihu nwa Jehoshafat nwa Nimshi we kekọta madu imegide Joram. (Ma Joram nēche Remot-gilead, ya onwe-ya na Israel nile, n'ihi Hazael, bú eze Siria: 15 ma Jehoram, bú eze, laghachiri ka agwọ ya nime Jezreel na ntib͕u nke ndi Siria tib͕uru ya, mb͕e o nēbuso Hazael, bú eze Siria, agha. ) Jihu we si, Ọ buru na nka bu uche-unu, ka onye-nb͕apu ghara isi n'obodo a pua ije igosi ya nime Jezreel. 16 Jihu we nọdu n'ub͕ọ-ala, jerue Jezreel; n'ihi na Joram nēdina n'ebe ahu. Ma Ehazaia, bú eze Juda, ridatara ihu Joram. 17 Ma onye-nche nēguzo n'elu ulo-elu na Jezreel, ọ hu ìgwè ndi Jihu mb͕e ọ nābia, ọ si, Ìgwè madu ka m'nāhu. Jehoram we si, Were onye-inyinya, ziga izute ha, ya si kwa, Ùdo di kwa? 18 Onye-nnọkwasi-inyinya we je izute ya, si, Otú a ka eze siri. Ùdo di kwa? Jihu we si, Gini ka gi na udo nwekọrọ? chigharia ga n'azum. Onye-nche ahu we gosi, si, Onye-ozi-ayi biakutere ha, ma ọ lataghi. 19 O we zipu onye-nnọkwasi-inyinya nke-abua, ọ biakute ha, si, Otú a ka eze siri, Ùdo di kwa? Jihu we si, Gini ka gi na udo nwekọrọ? chigharia ga n'azum. 20 Onye-nche we gosi, si, Ọ biaruru ha aru, ma ọ latagh: ma odudu-inyinya di ka odudu-inyinya Jihu nwa Nimshi; n'ihi na o nēdu inyinya dika onye nāwi ara. 21 Jehoram we si, Jikwa ub͕ọ-ala. Ha we jikwa ub͕ọ-ala-ya. Jehoram, bú eze Israel, na Ehazaia, bú eze Juda, we pua, nwoke ọ bula n'ub͕ọ-ala-ya, ha we pua izute Jihu, we huta ya n'òkè-ala-ubi Nebot, bú onye Jezreel. 22 O rue, mb͕e Jehoram huru Jihu, na ọ siri, Ùdo di kwa, Jihu? Ọ si, Gini bu udo ahu, na mb͕e ikwa-iko Jezebel, bú nne-gi, na mb͕asi-ya nādi ọtutu? 23 Jehoram we chigharia aka-ya abua, b͕alaga, si Ehazaia, Aghughọ di, Ehazaia. 24 Jihu we dọtia uta-ya ka aka-ya ra, b͕ata Jehoram n'ab͕ata ogwe-aka-ya abua, àkú we si n'obi-ya puta, o we ruru ala n'ub͕ọ-ala-ya. 25 Jihu we si Bidka, bú onye-isi-agha-ya, Bulie ya, tubà n'òkè ubi Nebot, bú onye Jezreel: n'ihi na cheta na mu na gi nānọkwasi n'elu inyinya, ayi abua, nēso Ehab, bú nna-ya, mb͕e Jehova boro ya ibu a; 26 N'ezie ahuwom ọbara Nebot na ọbara umu-ya ndikom n'abali hnyahuru, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta; M'gākwughachi kwa gi n'òkè-ala-ubi nka, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Ma ub͕u a bulie ya, tubà ya n'òkè-ala-ubi ahu, dika okwu Jehova si di. 27 Ma Ehazaia, bú eze Juda, huru ya, b͕alaga n'uzọ ulo ubi ab͕ara ogige. Jihu we chuso ya, si, Tib͕u-kwa-nu ya n'ub͕ọ-ala-ya. Ha we tib͕ue ya na nrigo Gua, nke di nso Ibleam. O we b͕alaga na Megido, nwua n'ebe ahu. 28 Ndi-orù-ya we me ka ub͕ọ-ala-ya būru ya jerue Jerusalem, ha we lìe ya n'ílì-ya, n'ebe elìri nna-ya-hà, n'obodo Devid. 29 Ma n'arọ nke-iri-na-otù nke Joram nwa Ehab ka Ehazaia malitere ibu eze Juda. 30 Jihu we biarue Jezreel, Jezebel we nu ya; ọ we de ihe-ichọ-nma n'anya-ya abua, me ka isi-ya di nma, lepu anya na window. 31 Mb͕e Jihu bara n'ọnu-uzọ-ama, nwayi ahu siri, Ùdo di kwa, Zimri, ob͕u onye-nwe-ya? 32 Jihu we welie iru-ya le anya na window, si, Ònye diyerem? ònye? Onozi abua ma-ọbu atọ we leputa anya n'ebe ọ nọ. 33 Ọ si, Tudanu ya. Ha we tuda ya: ufọdu nime ọbara-ya we fesa na mb͕idi, na n'inyinya-ya: ọ we zọkwasi ya ukwu. 34 Ọ bata, rie ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, si, Biko, Lenu nwayi a aburu ọnu anya nke-ọma, lìe ya: n'ihi na nwa-nwayi eze ka ọ bu. 35 Ha we je ilì ya: ma ha achọtaghi ihe ọ bula di n'aru-ya ma-ọbughi okpokoro-isi-ya, na ukwu-ya abua, na ọbu-aka-ya abua. 36 Ha we biaghachi, gosi ya. Ọ si, Okwu Jehova ka ọ bu, nke O kwuru n'aka orù-Ya, bú Elaija onye Tisbe, si, N'òkè-ala-ubi Jezreel ka nkita gēri anu-aru Jezebel: 37 ozu Jezebel gādi kwa ka ǹsí-anu n'elu ubi n'òkè-ala-ubi Jezreel; ha ewe ghara isi, Nka bu Jezebel.

2 Ndi-Eze 10

1 Ma Ehab nwere ọgu umu-ndikom atọ na iri nime Sameria. Jihu we de akwukwọ ziga na Sameria, zigara ndi-isi Jezreel, bú ndi-okenye, ziga-kwa-ra ndi nāzù umu Ehab, si, 2 Ma ub͕u a, mb͕e akwukwọ a bara n'aka-unu, ebe umu onye-nwe-unu nọ n'etiti unu, ebe ub͕ọ-ala na inyinya di kwa n'etiti unu, na obodo ewusiri ike, na ihe-agha; 3 leputanu onye ahu nke kachasi nma, nke zi-kwa-ra ezi karisia, nime umu-ndikom onye-nwe-unu, donu ya n'elu oche-eze nna-ya, buere ulo onye-nwe-unu agha. 4 Ha we tua egwu nke-uku ri nne, si, Le, eze abua eguzoghi n'iru ya: àyi onwe-ayi gēsi kwa aṅa guzo? 5 Onye nke bu onye-isi ulo, na onye nke bu onye-isi obodo, na ndi-okenye, na ndi nāzù umu eze, we zigara Jihu ozi, si, Ndi-orù-gi ka ayi bu, ayi gēme kwa ihe nile i si ayi me; ayi agaghi-eme nwoke ọ bula eze: gi me ihe di nma n'anya-gi. 6 O we degara ha akwukwọ nke ub͕ò abua, si, Ọ buru na mu ka unu diri, ọ buru kwa na olum ka unu onwe-unu nēge nti, chirinu isi ndikom ahu, bú umu onye-nwe-unu, biakutem dika mb͕e a echi rue Jezreel. Ma umu eze, bú ọgu ndikom atọ na iri, nọ n'aka ndi uku obodo ahu, ndi nāzùlite ha. 7 O rue, mb͕e akwukwọ ahu bara ha n'aka, na ha chiri umu eze, b͕ue ha, bú ọgu ndikom atọ na iri, tiye isi-ha nime nkata, zigara ya rue Jezreel. 8 Onye-ozi we bia, gosi ya, si, Ha ebubatawo isi umu eze. Ọ si, Tukọbanu ha n'obo abua n'oghere ọnu-uzọ-ama rue ututu. 9 O rue, n'ututu, na ọ puru, guzo, si ndi Israel nile, Ndi ezi omume ka unu bu: le, mu onwem kekọtara madu imegide onye-nwem, b͕ue ya: ma ònye tib͕uru ndia nile? 10 Maranu ub͕u a na ọ dighi okwu ọ bula gāda n'ala nime okwu Jehova, nke Jehova kwuru bayere ulo Ehab: n'ihi na Jehova emewo ihe O kwuru n'aka orù-Ya, bú Elaija. 11 Jihu we tib͕ue ndi nile fọduru ulo Ehab nime Jezreel, na ndi uku ya nile, na ndi ọ mara nke-ọma, na ndi-nchu-àjà-ya, rue mb͕e ọ dighi onye fọduru ọ rapuru ya. 12 O bilie, bia, jerue Sameria. Mb͕e ya onwe-ya ruru ulo-nlibe-anu nke ndi-ọzùzù-aturu n'uzọ, 13 Jihu hutara umu-nne Ehazaia, bú eze Juda, ọ si, Òle ndi ka unu bu? Ha si, Umu-nne Ehazaia ka ayi bu: ayi nārida kwa iju ajuju bayere udo umu eze na umu eze-nwayi. 14 Ọ si, Jidenu ha na ndu. Ha we jide ha na ndu, b͕ue ha n'olùlù ulo-nlibe-anu, bú ọgu ndikom abua na abua; o kweghi kwa ka nwoke ọ bula fọdu nime ha. 15 O si n'ebe ahu je, we huta Jehonadab nwa Rikab, ka ọ nābia izute ya: ọ gọzie ya, si ya, Obi-gi, ò ziri ezi, dika obim di n'ebe obi-gi di? Jehonadab we si, Otú a ka ọ di. Ọ buru na ọ di otú a, nyem aka-gi. O we nye ya aka-ya; o we me ka ọ rigo n'ub͕ọ-ala-ya. 16 Ọ si, Jesom, le ekworo m'nēkworo Jehova. Ha we me ka ọ ga ije n'ub͕ọ-ala-ya. 17 Ọ biarue Sameria, tib͕ue ndi nile fọduru Ehab nime Sameria, rue mb͕e o kpochapuru ya, dika okwu Jehova si di, nke Ọ gwara Elaija. 18 Jihu we chikọta ndi Israel nile, si ha, Ehab fère Beal òfùfè nke-ntà; Jihu gēfè ya òfùfè rinne. 19 Ma ub͕u a, kpọnu ndi-amuma nile nke Beal, na ndi nile nēfè ya, na ndi-nchu-àjà-ya nile, ka ha biakutem; ka aghara ile anya nwoke ọ bula ma ahughi ya: n'ihi na enwerem àjà uku ichuru Beal; onye ọ bula elere anya ya ma ahughi ya, ọ gaghi-adi ndu. Ma Jihu mere ya n'aghughọ, ka o we me ka ndi nēfè Beal la n'iyì. 20 Jihu we si, Donu ubọchi nb͕ochi nsọ nye Beal. Ha we kpọsa ya. 21 Jihu we ziga ozi n'Israel nile: ndi nile nēfè Beal we bia, ọ dighi kwa nwoke ọ bula fọduru nke nābiaghi. Ha we ba n'ulo Beal; ulo Beal we juputa na madu site n'otù ọnu-uzọ rue ọnu-uzọ ọzọ. 22 Ọ si onye ahu nke bu onye-isi ulo anēdebe uwe, Chiputara ndi nile nēfè Beal uwe. O we chiputara ha uwe. 23 Jihu we ba, ya na Jehonadab nwa Rikab, n'ulo Beal; ọ si ndi nēfè Beal, Chọsienu ike, hu, ka otù nime ndi nēfè Jehova ghara idi n'ebe a n'etiti unu, kama ndi nēfè Beal, nání ha. 24 Ha we ba ime àjà na àjà-nsure-ọku. Ma Jihu doro nye onwe-ya ọgu ndikom anọ n'èzí, si, Nwoke ahu nke kwere ka otù onye wepuga onwe-ya nime ndikom ahu ndi mu onwem nēme ka ha ba n'aka-unu, ndu-ya gālara ndu-ya. 25 O rue, mb͕e o surebìri àjà-nsure-ọku, na Jihu siri ndi-ọb͕a-ọsọ, si kwa ndi-isi-agha, Banu, tib͕ue ha; ekwela nwoke ọ bula pua. Ha we were ọnu mma-agha tib͕ue ha; ndi-ọb͕a-ọsọ na ndi-isi-agha tupuru ha n'èzí, jerue obodo ulo Beal. 26 Ha we buputa ogidi nke ulo Beal, sure ha ọku. 27 Ha kwatu-kwa-ra ogidi Beal, kwatu kwa Beal, me ka ọ buru olùlù-ọkwu, rue ta. 28 Jihu we kpochapu Beal n'Israel. 29 Nání nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat, nke o jiri me ka Israel mehie, Jihu ewezugaghi onwe-ya n'iso ha, bú umu-ehi ọla-edo ahu nke di na Bet-el, na nke di na Dan. 30 Jehova we si Jihu, N'ihi na i mewo nke-ọma n'ime ihe ziri ezi n'anyam, i we me ulo Ehab dika ihe nile si di nke di n'obim, umu-gi ndikom nke umu-umu nke-anọ gānọkwasiri gi n'oche-eze Israel. 31 Ma Jihu elezighi anya ijeghari n'iwu Jehova, bú Chineke Israel, n'obi-ya nile: o wezugaghi onwe-ya pua na nmehie nile nke Jeroboam, nke o jiri me ka Israel mehie. 32 Na mb͕e ahu ka Jehova malitere ibipu ufọdu n'Israel: Hazael we tib͕ue ha n'ókè ala nile nke Israel; 33 site na Jọdan n'ọwuwa-anyanwu, ala nile nke Gilead, ndi Gad, na ndi Reuben, na ndi Manase, site n'Aroea, nke di n'akuku ndagwurugwu Anon, bú Gilead na Beshan. 34 Ma okwu Jihu nile nke fọduru, na ihe nile o mere, na idi-ike-ya nile, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel? 35 Jihu we so nna-ya-hà dina n'ọnwu: ha we lìe ya na Sameria. Jehoahaz nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya. 36 Ma ubọchi Jihu bu eze Israel nime Sameria di orú arọ na asatọ.

2 Ndi-Eze 11

1 Mb͕e Atalaia, bú nne Ehazaia, huru na nwa-ya nwoke anwuwo, o bilie, me ka nkpuru nile ndi nwe ala-eze la n'iyì. 2 Ma Jehosheba, nwa-nwayi eze, bú Joram, nwa-nne-nwayi Ehazaia, were Joash nwa-nwoke Ehazaia, zupu ya n'etiti umu-ndikom eze ndi anēme ka ha nwua, o were ya na nwayi nēnye ya ara, tiye ha n'ime-ulo nke ihe-ndina; ha we zopu ya n'iru Atalaia, ewe ghara ime ka ọ nwua. 3 O we nọ n'aka-ya n'ulo Jehova nēzo onwe-ya arọ isi: Atalaia we buru eze ala ahu. 4 Ma n'arọ nke-asa Jehoiada zigara chita ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise, ndi diri ndi-Karait, na ndi diri ndi-ọb͕a-ọsọ, o me ka ha bakute ya n'ulo Jehova; ya na ha we b͕a ndu, o me ka ha ṅua iyi n'ulo Jehova, o me kwa ka ha hu nwa eze. 5 O we nye ha iwu, si, Nka bu ihe unu gēme: otù uzọ n'uzọ atọ nime unu, bú ndi nābà nime n'ubọchi-izu-ike, ganēdebe kwa ihe-ndebe ulo eze; 6 otù uzọ n'uzọ atọ gādi kwa n'ọnu-uzọ-ama Sua; otù uzọ n'uzọ atọ gādi kwa n'ọnu-uzọ-ama n'azu ndi-ọb͕a-ọsọ: unu gēdebe kwa ihe-ndebe nke ulo a, buru ihe-nb͕ochi. 7 Ma usu abua ahu nime unu, bú ndi nile nāpu apu n'ubọchi-izu-ike, ha gēdebe kwa ihe-ndebe ulo Jehova buruburu eze. 8 Unu gānọ kwa eze buruburu, nwoke ọ bula na ihe-agha-ya n'aka-ya; ma onye nābata nime akuku-unu, ka eme ka ọ nwua: unu nọye-kwa-ra eze mb͕e ọ nāpu n'èzí, na mb͕e ọ nābà nime. 9 Ndi-isi usu ọgu ndikom ise we me dika ihe nile si di nke Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, nyere n'iwu: ha we chiri, nwoke ọ bula ndikom-ya, bú ndi nābà nime n'ubọchi-izu-ike, ha na ndi nāpu apu n'ubọchi-izu-ike, ha we biakute Jehoiada, bú onye-nchu-àjà. 10 Onye-nchu-àjà we nye ndi-isi usu ọgu ndikom ise ube na ọta nke eze, bú Devid, nwereri, nke di n'ulo Jehova. 11 Ndi-ọb͕a-ọsọ we guzo, nwoke ọ bula na ihe-agha-ya n'aka-ya, site n'akuku aka-nri ulo rue akuku aka-ekpe ulo ahu, n'akuku ebe-ichu-àjà na n'akuku ulo, n'akuku eze buruburu. 12 O we me ka nwa eze puta, o kpube ya okpu-eze, nye ya ihe-àmà; ha we me ya eze, te ya manu, kua aka-ha, si, Ka eze di ndu. 13 Atalaia we nu olu ndi-ọb͕a-ọsọ na nke ndi Juda, o we biakute ndi ahu n'ulo Jehova: 14 ọ hu, ma, le, eze nēguzo n'akuku ogidi, dika ikpé si di, ndi-isi na opì-ha di kwa n'akuku eze; ndi nile nke ala ahu ṅuri-kwa-ra ọṅu, fùa opì. Atalaia we dọwa uwe-ya nile, kpọ, si, Nkekọta imegide eze, nkekọta imegide eze. 15 Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, we nye ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise iwu, bú ndi-nlekọta usu-ndi-agha, si ha, Menu ka ọ pua ba n'etiti akuku; ma onye nābiaso ya n'azu, werenu mma-agha me ka ọ nwua: n'ihi na onye-nchu-àjà siri, Ka aghara ime ka ọ nwua n'ulo Jehova. 16 Ha we doro ya onwe-ha n'akuku abua; o we si uzọ nbata inyinya ba n'ulo eze: ewe me ka ọ nwua n'ebe ahu. 17 Jehoiada we me ọb͕ub͕a-ndu nke di n'etiti Jehova na eze na ndi Juda, na ha gābu ndi Jehova nwere; na n'etiti eze na ndi Juda. 18 Ndi nile nke ala ahu we ba n'ulo Beal, kwatue ya; ebe-ichu-àjà-ya nile na onyinyo-ya nile, ha tupiara ha nke-ọma, ha b͕u-kwa-ra Matan, bú onye-nchu-àjà Beal, n'iru ebe-ichu-àjà ahu. Onye-nchu-àjà we do ndi-nkekọta ilekọta ulo Jehova. 19 Ọ we chiri ndi-isi usu ọgu ndikom ise, na ndi-Karait, na ndi-ọb͕a-ọsọ, na ndi nile nke ala ahu; ha we me ka eze si n'ulo Jehova rida, ha we si uzọ ọnu-uzọ-ama ndi-ọb͕a-ọsọ ba n'ulo eze. O we nọkwasi n'oche ndi-eze. 20 Ndi nile nke ala ahu we ṅuria ọṅu, obodo ahu di-kwa-ra jū: ha we were mma-agha me ka Atalaia nwua n'ulo eze. 21 Jehoash b͕ara arọ asa mb͕e ọ malitere ibu eze.

2 Ndi-Eze 12

1 N'arọ nke-asa nke Jihu ka Jehoash malitere ibu eze; o we buru eze ọgu arọ abua na Jerusalem: aha nne-ya bu Zibia nke Bia-sheba. 2 Jehoash we me ihe ziri ezi n'anya Jehova ubọchi-ya nile nke Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, zíri ya ihe. 3 Nání na ewezugaghi ebe di elu: ndi Juda nọ nāchu àjà, nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe di elu nile. 4 Jehoash we si ndi-nchu-àjà, Ego nile nke ihe nsọ nile nke anēwebata n'ulo Jehova, bú ego onye nāgabiga n'ebe ndi agukọtara agukọta nọ, nwoke ọ bula ego madu nile nke ọ̀rùrù-ọnu-ya, na ego nile nke ọ batara n'obi nwoke ọ bula iwebata n'ulo Jehova, 5 ka ndi-nchu-àjà were ya n'onwe-ha, nwoke ọ bula site n'aka onye ọ mara: ha onwe-ha gēme ka ebe etipúru etipú nke ulo ahu di ike, ebe ọ bula agāchọta ebe etipúru etipú. 6 O rue, n'arọ nke-orú-na-atọ nke eze, bú Jehoash, na ndi-nchu-àjà emeghi ka ebe etipúru etipú nke ulo ahu di ike. 7 Eze, bú Jehoash, we kpọ Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, kpọ kwa ndi-nchu-àjà ọzọ, si ha, Gini mere unu emeghi ka ebe etipúru etipú nke ulo ahu di ike? ma ub͕u a unu anarala ego n'aka ndi unu mara, kama nyenu ya ime ka ebe etipúru etipú nke ulo ahu di ike. 8 Ndi-nchu-àjà we kwere ka ha ghara inara ego n'aka ndi Juda, ka ha ghara kwa ime ka ebe etipúru etipú nke ulo ahu di ike. 9 Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, we were otù ib͕e, rapúe oghere n'okwu-ya, dọba ya n'akuku ebe-ichu-àjà, n'aka-nri nke ebe madu nābà n'ulo Jehova: ndi-nchu-àjà ndi nēche nbata-uzọ we tiye n'ebe ahu ego nile anēwebata n'ulo Jehova. 10 O rue, mb͕e ha huru na ego ahu riri nne n'ib͕e ahu, na ode-akwukwọ eze na onye-isi-nchu-àjà rigoro, ke ego ahu n'ihe, gu kwa ya, bú nke achọtara n'ulo Jehova. 11 Ha we nye ego ahu nke atùrù atù n'aka ndi nēje ozi ahu, bú ndi nēlekọta ulo Jehova: ha we weputa ya nye ndi-ọ̀kà n'osisi, nye kwa ndi nēwu ulo, bú ndi nālu ọlu n'ulo Jehova, 12 nye kwa ndi nēdo nkume, nye kwa ndi nāwa nkume, na iji zuta osisi na nkume awara awa ime ka ebe etipúru etipú nke ulo Jehova di ike, na ikwu ugwọ ihe nile nāputara ulo ahu ime ka ọ di ike. 13 Otú ọ di, emeghi iko ọla-ọcha, na ihe-ikpakepu-ọku, na ọkwa-nwusa, na opì, ihe ọla-edo ọ bula, ma-ọbu ihe ọla-ọcha, nye ulo Jehova, site n'ego nke anēwebata n'ulo Jehova: 14 n'ihi na ọ bu ndi nēje ozi ahu ka ha nyere ya, were kwa ya me ka ulo Jehova di ike. 15 Ha na ndikom ahu, ndi ha nēnye ego n'aka-ha inye ndi n'eje ozi ahu, agughi ego ahu: n'ihi na ọ bu n'ikwesi-ntukwasi-obí ka ndi ahu nēme ihe. 16 Adighi-ewebata ego àjà-ikpe-ọmuma na ego àjà-nmehie n'ulo Jehova: ọ bu ndi-nchu-àjà nwe ya. 17 Mb͕e ahu Hazael, bú eze Siria, rigoro, buso Gat agha, were ya: Hazael we che iru-ya imegide Jerusalem. 18 Jehoash, bú eze Juda, we chiri ihe nsọ nile nke Jehoshafat, na Jehoram, na Ehazaia, nna-ya-hà, bú ndi-eze Juda, doro nsọ, na ihe nsọ ya nile, na ọla-edo nile anāchọta n'àkù nile nke ulo Jehova, na nke ulo eze, zigara Hazael, bú eze Siria: o we si na Jerusalem rigo. 19 Ma okwu Joash nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda? 20 Ndi-orù-ya we bilie, kekọta nkekọta-madu imegide ya, tib͕ue Joash n'ulo Milo, n'uzọ nke nāridaru Sila. 21 N'ihi na Jozaka nwa Shimeat, na Jehozabad nwa Shomea, bú ndi-orù-ya, tib͕uru ya, o we nwua; ha we lìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Devid: Amazaia nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

2 Ndi-Eze 13

1 N'arọ nke-orú-na-atọ nke Jọash nwa Ehazaia, bú eze Juda, ka Jehoahaz nwa Jihu malitere ibu eze Israel nime Sameria arọ iri na asa. 2 O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, jeso nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat, nke o jiri me ka Israel mehie; o sighi nime ya wezuga onwe-ya. 3 Iwe Jehova we di ọku megide Israel, O nye ha n'aka Hazael, bú eze Siria, na n'aka Ben-hedad nwa Hazael, ubọchi nile. 4 Jehoahaz we chọ ime ka iru Jehova dajua, Jehova we ge ya nti: n'ihi na Ọ huru nmeb͕u Israel, n'ihi na eze Siria meb͕uru ha. 5 (Jehova we nye Israel onye-nzọputa, ha we pua n'okpuru aka Siria: umu Israel we biri n'ulo-ikwū-ha, dika na mb͕e gara aga. 6 Otú ọ di, ha esighi na nmehie nile nke ulo Jeroboam wezuga onwe-ha, bú nke o jiri me Israel ka ha mehie, ma Jehoahaz nējeghari nime ya: ọzọ kwa, Ashera guzoro na Sameria. ) 7 N'ihi na ọ kweghi ka ndi Israel ọ bula fọduru Jehoahaz, ọ bu nání ọgu ndi-inyinya abua na iri, na ub͕ọ-ala iri, na orú nnù ndikom na nnù ise ndi ji ukwu eje; n'ihi na eze Siria mere ka ha la n'iyì, me kwa ha ka ha di ka ájá izọkwasi ukwu. 8 Ma okwu Jehoahaz nile nke fọduru, na ihe nile o mere, na idi-ike-ya, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ nke ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel? 9 Jehoahaz we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, ha we lìe ya na Sameria: Joash nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya. 10 N'arọ nke-orú-na-iri-na-asa nke Joash, bú eze Juda, ka Jehoash nwa Jehoahaz malitere ibu eze Israel; nime Sameria arọ iri na isi. 11 O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova; o sighi na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat, bú nke o jiri me ka Israel mehie, wezuga onwe-ya: kama o jeghariri nime ya. 12 Ma okwu Joash nile nke fọduru, na ihe nile o mere, na idi-ike-ya nke o jiri buso Amazaia, bú eze Juda, agha, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel? 13 Joash we so nna-ya-hà dina n'ọnwu; Jeroboam we nọkwasi n'oche-eze-ya: ewe lìe Joash nime Sameria n'ebe elìri ndi-eze Israel. 14 Ma Elaisha nāria ọria nke ọria-ya ahu nke ọ nwuru nime ya: Joash, bú eze Israel, we ridakuru ya, kwa ákwá n'iru ya, si, Nnam, nnam, ub͕ọ-ala Israel, na ndi-inyinya-ya! 15 Elaisha we si ya, Chiri uta na àkú: o we chiri uta na àkú n'aka-ya. 16 Ọ si eze Israel, Tukwasi aka-gi n'uta: o we tukwasi aka-ya. Elaisha we tukwasi aka-ya abua n'aka abua nke eze. 17 Ọ si, Meghe window n'akuku Iru-anyanwu: o we meghe. Elaisha we si, B͕a: o we b͕a. Ọ si, Àkú nzọputa Jehova nwere, bú àkú nzọputa imegide Siria: i gētib͕u kwa Siria n'Efek, rue mb͕e i gēme ka ha gwusia. 18 Ọ si, Chiri àkú: o we chiri ha. Ọ si eze Israel, Tida n'ala: o we tie ub͕ò atọ, guzo. 19 Onye nke Chineke ahu we wesa ya iwe, si, Asi na i tiri ub͕ò ise ma-ọbu ub͕ò isi; mb͕e ahu i gēti Siria rue mb͕e i gēme ka ọ gwusia: ma ub͕u a i gēti Siria nání ub͕ò atọ. 20 Elaisha we nwua, ha we lìe ya. Ma usu ndi nāpunara madu ihe nke ndi Moab batara n'ala mb͕e arọ ọhu biara. 21 O rue, mb͕e ha nēli otù nwoke, le, ha huru usu ndi nāpunara madu ihe; ha we tubà nwoke ahu n'ílì Elaisha: nwoke ahu we da, metu ọkpukpu Elaisha aru, we di ndu, bilie guzo n'ukwu-ya abua. 22 Ma Hazael, bú eze Siria, meb͕uru Israel ub͕ochi nile nke Jehoahaz. 23 Jehova we mere ha amara, nwe obi-ebere n'aru ha, che ha iru, n'ihi ọb͕ub͕a-ndu-Ya nke Ya na Abraham na Aisak na Jekob mere, O kweghi kwa ibibi ha, O sighi kwa n'iru Ya chupu ha rue ub͕u a. 24 Hazael, bú eze Siria, we nwua; Ben-hedad nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya. 25 Jehoash nwa Jehoahaz we naghachi n'aka Ben-hedad nwa Hazael obodo nile nke ọ nara n'aka Jehoahaz nna-ya n'agha. Ub͕ò atọ ka Joash tib͕uru ya, we weghachi obodo nile nke Israel.

2 Ndi-Eze 14

1 N'arọ nke-abua nke Joash nwa Joahaz, bú eze Israel, ka Amazaia nwa Joash, bú eze Juda, malitere ibu eze. 2 Ọ b͕ara orú arọ na ise mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze orú arọ na iteghete na Jerusalem: aha nne-ya bu Jehoadin nke Jerusalem. 3 O me ihe ziri ezi n'anya Jehova, nání na o meghi dika Devid nna-ya; dika ihe nile si di nke Joash nna-ya mere, otú a ka o mere. 4 Nání na ewzugaghi ebe di elu: ndi Juda nọ nāchu àjà, nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe nile di elu. 5 O rue, mb͕e ala-eze di ike n'aka-ya, na o tib͕uru ndi-orù-ya ndi tib͕uru eze, bú nna-ya: 6 ma o meghi ka umu nke ndi-otib͕u-madu ahu nwua: dika nke edeworo n'akwukwọ iwu Moses si di, nke Jehova nyere n'iwu, si, Agaghi-eme ka ndi bu nna nwua n'ọnọdu umu-ha, agaghi-eme kwa ka umu nwua n'ọnọdu ndi bu nna-ha; kama onye ọ bula gānwu nime nmehie nke aka ya. 7 Ya onwe-ya tib͕uru Edom nime Ndagwurugwu Nnú, orú nnù ndikom na nnù ise, were kwa Sela n'agha, kpọ aha-ya Jokteel, rue ta. 8 Mb͕e ahu Amazaia zigara ndi-ozi jekuru Jehoash nwa Jehoahaz nwa Jihu, bú eze Israel, si, Bia, ka ayi lerita onwe-ayi anya n'iru. 9 Jehoash, bú eze Israel, we zigara Amazaia, bú eze Juda, ozi, si, Uke nke di na Lebanon zigara osisi cedar nke di na Lebanon ozi, si, Nye nwam nwoke nwa-gi nwayi na nwunye: anu-ọhia nke di na Lebanon we gabiga, zọpia uke ahu. 10 I tib͕uwo Edom n'ezie, obi-gi we bulie gi elu: ka asọpuru gi na nka, nọdu kwa n'ulo-gi; ma n'ìhi gini ka i nākpali onwe-gi n'ihe ọjọ, ka i we da, gi onwe-gi, na Juda soro gi? 11 Ma Amazaia anughi. Jehoash, bú eze Israel, we rigo; ya onwe-ya na Amazaia, bú eze Juda, we lerita onwe-ha anya n'iru na Bet-shemesh, nke Juda nwere. 12 Ewe tib͕ue Juda n'iru Israel; ha we b͕alaga, nwoke ọ bula n'ulo-ikwū-ya. 13 Jehoash, bú eze Israel, we jide Amazaia, bú eze Juda, nwa Jehoash nwa Ehazaia, nime Bet-shemesh, we biarue Jerusalem, tipue mb͕idi Jerusalem site n'ọnu-uzọ-ama Efraim rue ọnu-uzọ-ama nke nkuku, nnù cubit. 14 Ọ chiri ọla-edo na ọla-ọcha nile, na ihe nile ahutara n'ulo Jehova, na n'àkù nile nke ulo eze, na ndi edoro na mbe, o we laghachi na Sameria. 15 Ma ihe Jehoash nile nke fọduru, nke o mere, na idi-ike-ya, na otú o busoro Amazaia, bú eze Juda, agha èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel? 16 Jehoash we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya nime Sameria n'ebe elìri ndi-eze Israel; Jeroboam nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya. 17 Amazaia nwa Joash, bú eze Juda, we di ndu mb͕e ọnwu Jehoash nwa Jehoahaz, bú eze Israel, gasiri, arọ iri na ise. 18 Ma ihe nile nke Amazaia mere nke fọduru, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda? 19 Ha we kekọta nkekọta-madu megide ya nime Jerusalem; o we b͕alaga na Lekish: ha we ziga ichuso ya rue Lekish, me ka ọ nwua n'ebe ahu. 20 Ha we bute ya n'elu inyinya: ewe lìe ya nime Jerusalem n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Devid. 21 Ndi nile nke Juda we were Azaraia, ma onye ahu b͕ara arọ iri na isi, ha we me ya eze n'ọnọdu nna-ya Amazaia. 22 Ya onwe-ya wuru Ilat, nyeghachi ya Juda, mb͕e eze sorosiri nna-ya-hà dina n'ọnwu. 23 N'aro nke-iri-na-ise nke Amazaia nwa Joash, bú eze Juda, ka Jeroboam nwa Joash, bú eze Israel, malitere ibu eze na Sameria ọgu arọ abua na otù. 24 O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova: o sighi na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe-ya, bú nke o jiri me ka Israel mehie. 25 Onye ahu weghachiri ókè-ala Israel site na nbata Hemat rue oké osimiri Araba, dika okwu Jehova, bú Chineke Israel, si di, nke O kwuru site n'aka Jona nwa Amitai, bú onye-amuma, nke sitere na Gat-hefa. 26 N'ihi na Jehova huru nweda-n'ala nke Israel, na ọ di ilu nke-uku: ọ dighi kwa onye eb͕ochiri eb͕ochi ma-ọdu onye arapuru fọduru, ọ dighi kwa onye-iye-aka ọ bula Israel nwere. 27 Ma Jehova ekwughi na Ọ gēhichapu aha Israel n'okpuru elu-igwe: O we si n'aka Jeroboam nwa Joash zọputa ha. 28 Ma okwu Jeroboam nile nke fọduru, na ihe nile o mere, na idi-ike-ya, otú o buru agha, otú o weghachi-kwa-ra Damaskọs, na Hemat, nke Juda nwere, nye Israel, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel? 29 Jeroboam we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, bú ndi-eze Israel; Zekaraia nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

2 Ndi-Eze 15

1 N'arọ nke-orú-na-asa nke Jeroboam, bú eze Israel, ka Azaraia nwa Amazaia, bú eze Juda, malitere ibu eze. 2 Arọ iri na isi ka ọ b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; ọ buru eze ọgu arọ abua iri na abua nime Jerusalem: aha nne-ya bu Jekolaia nke Jerusalem. 3 O me ihe ziri ezi n'anya Jehova, dika ihe nile si di nke Amazaia nna-ya mere. 4 Nání na ewezugaghi ebe di elu: ndi Juda nọ nāchu àjà nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe di elu nile. 5 Jehova we tie eze ahu ihe, o we buru onye-ekpenta rue ubọchi ọnwu-ya, we biri n'ulo ewupuru iche. Ma Jotam nwa eze bu onye-isi ulo-ya, nēkpe ndi ala ahu ikpe. 6 Ma okwu Azaraia nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda? 7 Azaraia we so nna-ya-ha dina n'ọnwu; ha we lìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Devid: Jotam nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya. 8 N'arọ nke-orú-na-iri-na-asatọ nke Azaraia, bú eze Juda, ka Zekaraia nwa Jeroboam malitere ibu eze Israel nime Sameria ọnwa isi. 9 O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova dika nna-ya-hà mere: o sighi na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe-ya, bú nke o jiri me ka Israel mehie. 10 Shalum nwa Jedesh we kekọta madu imegide ya, tib͕ue ya n'iru ndi Israel, me ka ọ nwua, we buru eze n'ọnọdu ya. 11 Ma ihe Zekaraia mere nke fọduru, le, edewo ha n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel. 12 Nka bu okwu Jehova, nke Ọ gwara Jihu, si, Umu-gi ndikom nke umu-umu nke-anọ gānọkwasiri gi n'oche-eze Israel. O we di otú a. 13 Shalum nwa Jebesh malitere ibu eze n'arọ nke-orú-na-iri-na-iteghete nke Uzaia, bú eze Juda; o we buru eze ogologo otù ọnwa nime Sameria. 14 Menahem nwa Gadi we si na Tiaza rigo, biarue Sameria, tib͕ue Shalum nwa Jebesh nime Sameria, me ka ọ nwua, we buru eze n'ọnọdu ya. 15 Ma ihe nile Shalum mere nke fọduru, na nkekọta-ya nke ọ kekọtara madu imegide eze, le, edewo ha n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel. 16 Mb͕e ahu Menahem tib͕uru Tifsa na ndi nile nọ nime ya, na ókè-ala-ya nile, site na Tiaza: n'ihi na ha emegheghi ya uzọ, n'ihi ya ka o tib͕uru ya; ndinyom-ya nile ndi di ime, ọ b͕awara ha afọ. 17 N'arọ nke-orú-na-iri-na-iteghete nke Azaraia, bú eze Juda, ka Menahem nwa Gadi malitere ibu eze Israel arọ iri nime Sameria. 18 O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova: o sighi na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe-ya ubọchi-ya nile, bú nmehie o jiri me ka Israel mehie. 19 Pul, bú eze Asiria, we bia imegide ala ahu; Menahem we nye Pul nnù talent ọla-ọcha abua na ọgu iri, ka aka-ya we diyere ya ime ka ala-eze di ike n'aka-ya. 20 Menahem we naputa ego ahu n'aka Israel, bú n'aka ndi-dike n'àkù, inye eze Asiria, ọgu shekel ọla-ọcha abua na iri diri otù nwoke. Eze Asiria we laghachi, o guzoghi kwa n'ebe ahu n'ala ahu. 21 Ma okwu Menahem nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel? 22 Menahem we so nna-ya-hà dina n'ọnwu; Pekahaia nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya. 23 N'arọ nke-ọgu-abua-na-iri nke Azaraia, bú eze Juda, ka Pekahaia nwa Menahem malitere ibu eze Israel nime Sameria arọ abua. 24 O wee me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova; o sighi na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe-ya, bú nke o jiri me ka Israel mehie. 25 Peka nwa Remalaia, bú onye-isi-agha-ya, we kekọta madu imegide ya, tib͕ue ya nime Sameria, n'ulo-elu nke ulo eze, ya na Agob na Arie; ọgu ndikom abua na iri nke umu ndi Gilead nọye-kwa-ra ya: o we me ka ọ nwua, we buru eze n'ọnọdu ya. 26 Ma okwu Pekahaia nile nke fọduru, na ihe nile o mere, le, edewo ha n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel. 27 N'arọ nke-ọgu-abua-na-iri-na-abua nke Azaraia, bú eze Juda, ka Peka nwa Remalaia malitere ibu eze Israel nime Sameria orú arọ. 28 O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova: o sighi na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe-ya, bú nke o jiri me ka Israel mehie. 29 N'ubọchi Peka, bú eze Israel, ka Tiglat-pilesa, bú eze Asiria, biara, were Ijon, na Ebel-bet-meaka, na Janoa, na Kedesh, na Hezoa, na Gilead, na Galili, bú ala nile nke Naftali; o we me ka ha je biri n'Asiria. 30 Hoshea nwa Ila we kekọta nkekọta-madu megide Peka nwa Remalaia, tib͕ue ya, me ka ọ nwua, we buru eze n'ọnọdu ya, n'arọ nke-orú nke Jotam nwa Uzaia. 31 Ma okwu Peka nile nke fọduru, na ihe nile o mere, le, edewo ha n'akwukwọ, ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel. 32 N'arọ nke-abua nke Peka nwa Remalaia, bú eze Israel, ka Jotam nwa Uzaia, bú eze Juda, malitere ibu eze. 33 Orú arọ na ise ka ọ b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ iri na isi nime Jerusalem: aha nne-ya bu Jerusha nwa-nwayi Zedok. 34 O me ihe ziri ezi n'anya Jehova: dika ihe nile si di nke Uzaia nna-ya mere, otú a ka o mere. 35 Nání na ewezugaghi ebe di elu: ndi Juda nọ nāchu àjà nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe di elu nile. Onye ahu wuru ọnu-uzọ-ama ulo Jehova nke di n'elu. 36 Ma okwu Jotam nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda? 37 Na mb͕e ahu ka Jehova malitere izite Rezin, bú eze Siria, na Peka nwa Remalaia, imegide Juda. 38 Jotam we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà, n'obodo Devid nna-ya: Ehaz nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

2 Ndi-Eze 16

1 N'arọ nke-iri-na-asa nke Peka nwa Remalaia ka Ehaz nwa Jotam, bú eze Juda, malitere ibu eze. 2 Orú arọ ka Ehaz b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ iri na isi nime Jerusalem: ma o meghi ihe ziri ezi n'anya Jehova, bú Chineke-ya, dika Devid nna-ya. 3 Ma o jere ije n'uzọ ndi-eze Israel. Ọzọ kwa, o mere ka nwa-ya nwoke gabiga nime ọku, dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di, bú ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel. 4 Ọ chua àjà, sure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe nile di elu, na n'elu ugwu ntà nile, na n'okpuru osisi ndu ọ bula. 5 Mb͕e ahu Rezin, bú eze Siria, na Peka nwa Remalaia, bú eze Israel, rigoruru Jerusalem ibu agha: ha we nọchigide Ehaz n'agha, ma ha apughi ibu agha. 6 Na mb͕e ahu ka Rezin, bú eze Siria, weghachiri Ilat nye Siria, chupu ndi-Ju n'Ilot: ndi Siria we ba n'Ilat, biri n'ebe ahu, rue ta. 7 Ehaz we zigara Tiglat-pilesa, bú eze Asiria, ndi-ozi, si, Orù-gi na nwa-gi ka m'bu: rigota, zọputam n'aka eze Siria na n'aka eze Israel, ndi nēbili imegidem. 8 Ehaz we chiri ọla-ọcha na ọla-edo anāchọta n'ulo Jehova, na n'àkù nile nke ulo eze, zigara eze Asiria ka ọ buru ihe-iri-ngo. 9 Eze Asiria we ge ya nti: eze Asiria we rigorue Damaskọs, were ya, me ka ndi-ya je biri na Kia, o me-kwa-ra ka Rezin nwua. 10 Eze, bú Ehaz, we je izute Tiglat-pilesa, bú eze Asiria, na Damaskọs, we hu ebe-ichu-àjà nke di na Damaskọs: eze, bú Ehaz, we zigara Uraija, bú onye-nchu-àjà, oyiyi ebe-ichu-àjà ahu, na ihe-atù-ya, dika ọlu nile aluru ya si di. 11 Uraija, bú onye-nchu-àjà, we wue ebe-ichu-àjà ahu: dika ihe nile si di nke eze, bú Ehaz, siri na Damaskọs zite, otú a ka Uraija, bú onye-nchu-àjà, mere, rue mb͕e eze, bú Ehaz, siri na Damaskọs bia. 12 Eze we si na Damaskọs bia, eze we hu ebe-ichu-àjà ahu: eze we biarue ebe-ichu-àjà ahu nso, sure àjà-nsure-ọku n'elu ya. 13 Ọ we sure àjà-nsure-ọku-ya ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, sure kwa onyinye-inata-iru-ọma-ya, wusi kwa àjà-ihe-ọṅuṅu-ya, wusa kwa ọbara àjà-udo-ya nile, n'elu ebe-ichu-àjà ahu. 14 Ma ebe-ichu-àjà ọla ahu, nke di n'iru Jehova, o si n'iru ulo ahu, si n'etiti ebe-ichu-àjà-ya na ulo Jehova, bute ya nso, tiye ya n'akuku Ugwu ebe-ichu-àjà-ya. 15 Eze, bú Ehaz, we nye Uraija, bú onye-nchu-àjà, iwu, si, N'elu ebe-ichu-àjà uku ahu ka i gēsure àjà-nsure-ọku ututu ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na onyinye-inata-iru-ọma nke anyasi, na àjà-nsure-ọku nke eze, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, ha na àjà-nsure-ọku nke ndi nile nke ala nka, na onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha; ọbara nile nke àjà-nsure-ọku, na ọbara nile nke àjà, n'elu ya ka i gāwusa kwa ya: ma ebe-ichu-àjà ọla ahu gādirim iji ju ase. 16 Uraija, bú onye-nchu-àjà, we me ya, dika ihe nile si di nke eze, bú Ehaz, nyere ya n'iwu. 17 Eze, bú Ehaz, we bipu ihe-njikọ nile nke ihe-ndọkwasi nile, si n'elu ha wezuga ite ọsisa-miri: o si-kwa-ra n'elu ehi ọla nke di n'okpuru ya weda oké osimiri ahu, tiye ya n'elu pavement nkume. 18 Ma uzọ ekpuru ekpu nke ubọchi-izu-ike nke ha wuru n'ulo ahu, na nbata eze nke di n'èzí, ọ b͕anwere ha rue ulo Jehova, n'ihi eze Asiria. 19 Ma ihe Ehaz nile nke fọduru nke o mere, èdeghi ihe ahu n'akukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda? 20 Ehaz we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Devid: Hezekaia nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

2 Ndi-Eze 17

1 N'arọ nke-iri-na-abua nke Ehaz, bú eze Juda, ka Hoshea nwa Ila malitere ibu eze Israel nime Sameria arọ iteghete. 2 O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, nání na o meghi dika ndi-eze Israel ndi buru ya uzọ. 3 Ya ka Shalmanesa, bú eze Asiria, rigoro imegide; Hoshea we ghọ orù-ya, butere ya onyinye-inata-iruọma. 4 Eze Asiria we hu nkekọta-madu imegide ya n'aru Hoshea; n'ihi na o zigara So, bú eze Ijipt, ndi-ozi, ma o bugoghi onyinye-inata-iru-ọma inye eze Asiria, dika ọ nēme kwa-arọ: eze Asiria we mechibido ya, ke ya ab͕u n'ulo-nkpọrọ. 5 Eze Asiria we rigo n'ala ahu nile, rigorue Sameria, nọchigide ya n'agha arọ atọ. 6 N'arọ nke-iteghete nke Hoshea ka eze Asiria were Sameria, me ka Israel je biri n'Asiria, me ka ha biri nime Hala, na nime Haboa, n'osimiri Gozan, na n'obodo ndi Midia. 7 O rue, n'ihi na umu Israel mehiere megide Jehova, bú Chineke-ha, Onye nēme ka ha si n'ala Ijipt, si n'okpuru aka Fero, bú eze Ijipt, rigoputa, n'ihi na ha tu-kwa-ra egwu chi di iche iche ọzọ, 8 we jeghari n'ukpuru nile nke mba ọzọ, bú ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel, na n'ukpuru ndi-eze Israel, nke ha mere. 9 Umu Israel we were nzuzo me ihe nke nēzighi ezi megide Jehova, bú Chineke-ha, ha we wuere onwe-ha ebe di elu n'obodo-ha nile, site n'ulo-elu ndi nēche nche rue obodo ewusiri ike. 10 Ha guzo-kwa-ra ogidi na Asherim nye onwe-ha n'elu ugwu ọ bula di elu, na n'okpuru osisi ndu ọ bula: 11 ha we sure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe ahu n'ebe nile di elu, dika mba ọzọ mere, bú ndi Jehova mere ka ha je biri n'ala ọzọ n'iru ha; ha me-kwa-ra ihe ọjọ di iche iche ikpasu Jehova iwe: 12 ha we fè arusi di iche iche òfùfè, nke Jehova siri ha, Unu emela ihe a. 13 Jehova we b͕ara Israel àmà, b͕a-kwa-ra Juda, site n'aka onye-amuma ọ bula, na onye-ọhu-uzọ ọ bula, si, Sinu n'uzọ ọjọ nile unu laghachi, debe ihe nile M'nyere n'iwu, na ukpurum nile, dika iwu ahu nile si di nke M'nyere nna-unu-hà n'iwu, nke M'zite-kwa-ra unu n'aka ndi-orùm, bú ndi-amuma. 14 Ma ha anughi, kama ha kwesiri olu-ha ike, dika olu ndi bu nna-ha, ndi nēkweghi na Jehova, bú Chineke-ha. 15 Ha we ju ukpuru-Ya nile, na ọb͕ub͕a-ndu-Ya nke Ya na ndi bu nna-ha b͕ara, na ihe-àmà-Ya nile nke Ọ b͕ara ha; ha we jeso ihe-efu, we ghọ ihe-efu, soro mba ọzọ ndi nọ ha buruburu, ndi Jehova nyere ha iwu bayere ha, ka ha ghara ime dika ha. 16 Ha we rapu ihe nile Jehova, bú Chineke-ha, nyere n'iwu, ha we mere onwe-ha arusi awuru awu, bú umu-ehi abua, me kwa Ashera, kpọ isi ala nye usu nile nke ihe elu-igwe, fè Beal òfùfè. 17 Ha me-kwa-ra ka umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom gabiga nime ọku, ha nāju kwa ase, nāb͕a afa, re onwe-ha ime ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, ikpasu Ya iwe. 18 Jehova we wesa Israel iwe nke-uku, si n'iru Ya wezuga ha: ọ dighi ndi fọduru, nābughi ebo Juda, nání ya. 19 Juda edebeghi kwa ihe nile Jehova, bú Chineke-ha, nyere n'iwu, kama ha jeghariri n'ukpuru nile nke Israel nke ha mere. 20 Jehova we ju nkpuru nile nke Israel, weda ha n'ala, nye ha n'aka ndi nāpunara madu ihe, rue mb͕e O siri n'iru Ya chupu ha. 21 N'ihi na Ọ dọwapuru Israel n'ulo Devid; ha we me Jeroboam nwa Nebat eze: Jeroboam we chuputa Israel n'iso Jehova, o we me ka ha mehie nmehie uku. 22 Umu Israel we jegharia nime nmehie nile nke Jeroboam, nke o mere; ha esighi nime ha wezuga onwe-ha; 23 rue mb͕e Jehova siri n'iru Ya wezuga Israel, dika O kwuru site n'aka ndi-orù-Ya nile, bú ndi-amuma. Ewe me ka Israel si n'elu ala-ha je biri n'Asiria, rue ta. 24 Eze Asiria we me ka madu si na Babilon, si kwa na Kuta, si Kwa n'Ava, si kwa na Hemat na Sefavaim, bia, o me ka ha biri n'obodo nile nke Sameria n'ọnọdu umu Israel: ha we nweta Sameria, biri n'obodo-ya nile. 25 O rue, na nmalite obibi-ha n'ebe ahu, na ha atughi egwu Jehova: Jehova we zìe ọdum n'etiti ha, ha we nēb͕u ufọdu nime ha. 26 Ha we gwa eze Asiria okwu, si, Mba ndi i mere ka ha je biri n'ala ọzọ, bú ndi i mere ka ha biri n'obodo Sameria, ha amaghi ikpé Chineke nke ala ahu: O we zìe ọdum n'etiti ha, ma, le, ha nēme ka ha nwua, n'ihi na ha amaghi ikpé Chineke nke ala ahu. 27 Eze Asiria we nye iwu, si, Me ka otù onye nime ndi-nchu-àjà je n'ebe ahu, bú ndi unu mere ka ha si n'ebe ahu je biri n'ala ọzọ; ka ha je kwa biri n'ebe ahu, ka o zí kwa ha ikpé Chineke ala ahu: 28 Otù onye nime ndi-nchu-àjà ahu ndi ha mere ka ha si na Sameria je biri n'ala ọzọ we bia biri na Bet-el, we nēzí ha otú ha gātu egwu Jehova. 29 Ha we nēme, mba ọ bula chi nke aka ya, ha we dọba ha n'ulo nke ebe di elu nke ndi Sameria mere, mba ọ bula n'obodo-ha ebe ha onwe-ha nēbi. 30 Ndikom Babilon we me Sukot-benot, ndikom Kut me-kwa-ra Neagal, ndikom Hemat me-kwa-ra Ashima, 31 ndikom Ava me-kwa-ra Nibaz na Tatak, ma ndi Sefavaim nēsurere Adramelek na Anamelek umu-ha n'ọku, bú chi abua nke Sefavaim. 32 Ha we nātu egwu Jehova, mere onwe-ha ndi-nchu-àjà nke ebe nile di elu sitere n'ọnu-ọgugu-ha nile, ha we nēmere ha ihe n'ulo nke ebe nile di elu. 33 Jehova ka ha nātu egwu, ma chi di iche iche nke aka ha ka ha nēfè, dika ikpé mba nile si di, bú ndi emere ka ha si n'ebe ahu je biri n'ala ọzọ. 34 Rue ta ndi ahu nēme dika ikpé mbu nile si di: ha adighi-atu egwu Jehova, ha adighi-eme kwa dika ukpuru nile ha si di, ma-ọbu dika ikpé-ha si di, ma-ọbu dika iwu si di, ma-ọbu dika ihe enyere n'iwu si di, nke Jehova nyere umu Jekob n'iwu, bú onye Ọ guru aha-ya Israel; 35 Jehova we soro ha b͕a ndu, nye ha iwu, si, Unu atula egwu chi di iche iche ọzọ, unu akpọ-kwa-la isi ala nye ha, unu efè-kwa-la ha òfùfè, unu achu-kwara-la ha àjà: 36 kama Jehova, Onye were ike uku na ogwe-aka esetiri eseti me ka unu si n'ala Ijipt rigoputa, Ya ka unu gātu egwu, Ya ka unu gākpọ kwa isi ala nye, Ya ka unu gāchu-kwa-ra àjà: 37 ukpuru nile na ikpé nile na iwu na ihe enyere n'iwu, nke O dere n'akwukwọ nye unu, ndia ka unu gēlezi kwa anya ime ubọchi nile; ma unu atula egwu chi di iche iche ọzọ: 38 ma ọb͕ub͕a-ndu Mu na unu b͕ara, unu echezọla ya; unu atu-kwa-la egwu chi di iche iche ọzọ: 39 kama Jehova, bú Chineke-unu, ka unu gātu egwu; Ya onwe-ya gānaputa kwa unu n'aka ndi-iro-unu nile. 40 Ma ha anughi, kama dika ikpé mbu ha si di ka ha onwe-ha nēme. 41 Mba ndia we nātu egwu Jehova, ma ọ bu arusi nile ha apiri api ka ha nēfè; umu-ha kwa, na umu umu-ha, dika ndi bu nna-ha mere, otú a ka ha onwe-ha nēme rue ta.

2 Ndi-Eze 18

1 O rue, n'arọ nke-atọ nke Hoshea nwa Ila, bú eze Israel, na Hezekaia nwa Ehaz, bú eze Juda, malitere ibu eze. 2 Orú arọ na ise ka ọ b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze orú arọ na iteghete nime Jerusalem: aha nne-ya bu Abi nwa-nwayi Zekaraia. 3 O me ihe ezi ziri n'anya Jehova, dika ihe nile si di nke Devid nna-ya mere. 4 Ya onwe-ya wezugara ebe nile di elu, titue ogidi nile, b͕utue Ashera: o tipia-kwa-ra agwọ ọla nke Moses mere; n'ihi na rue mb͕e ahu umu Israel nēsurere ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; o we kpọ ya Nehushtan. 5 Ọ bu na Jehova, bú Chineke Israel, ka ọ tukwasiri obi; mb͕e ọ nwusiri ọ dighi kwa onye ọzọ di ka ya n'etiti eze nile nke Juda, ma-ọbu n'etiti ndi buru ya uzọ. 6 O we rapara Jehova n'aru, o sighi n'iso Ya wezuga onwe-ya, o we debe ihe nile O nyere n'iwu, bú nke Jehova nyere Moses n'iwu. 7 Jehova nọye-kwa-ra ya; n'ebe o bula ọ nāpu o nwere uche: o we nupu isi n'okpuru eze Asiria, o fèghi kwa ya òfùfè. 8 Ya onwe-ya tib͕uru ndi Filistia rue Geza na ókè-ala-ya nile, site n'ulo-elu ndi nēche nche rue obodo ewusiri ike. 9 O rue, n'arọ nke-anọ nke eze, bú Hezekaia, nke ahu bu arọ nke-asa nke Hoshea nwa Ila, bú eze Israel, na Shalmanesa, bú eze Asiria, rigoro imegide Sameria, nọchigide ya n'agha. 10 Ha we were ya n'ọgwugwu arọ atọ: ọ bu n'arọ nke-isi nke Hezekaia, nke ahu bu arọ nke-iteghete nke Hoshea, bú eze Israel, ka ewere Sameria. 11 Eze Asiria we me ka Israel je biri n'Asiria, o we me ka ha nọdu nime Hala na nime Haboa, n'osimiri Gozan, na n'obodo ndi Midia: 12 n'ihi na ha egeghi nti olu Jehova, bú Chineke-ha, we gabiga ọb͕ub͕a-ndu-Ya, bú ihe nile nke Moses, bú orù Jehova, nyere n'iwu, ha anughi kwa ya, ha emeghi kwa ya. 13 Ma n'arọ nke-iri-na-anọ nke eze, bú Hezekaia, Senakerib, bú eze Asiria, rigoro imegide obodo nile ewusiri ike nke Juda, were ha. 14 Hezekaia, bú eze Juda, we zigara eze Asiria ozi rue Lekish, si, Emehiewom; si n'ebe m'nọ laghachi: ihe i gēbom m'gēburu ya. Eze Asiria we tukwasi Hezekaia, bú eze Juda, ọgu talent ọla-ọcha iri-na-ise na orú talent ọla-edo na iri. 15 Hezekaia we nye ya ọla-ọcha nile nke anāchọta n'ulo Jehova, na n'àkù nile nke ulo eze. 16 Na mb͕e ahu ka Hezekaia bipuru ibo-ọnu-uzọ nile nke ulo uku Jehova, na ogidi nile nke Hezekaia, bú eze Juda, jiri ọla-edo machita, o were ha nye eze Asiria. 17 Eze Asiria we si na Lekish zie Tatan na Rab-saris na Rabshake jekuru eze, bú Hezekaia, ha na oké usu-ndi-agha, rue Jerusalem. Ha we rigo biarue Jerusalem. Ha we rigo, bia, guzo n'akuku uzọ-miri nke ọdọ-miri di n'elu, nke di n'uzọ atuliri atuli nke ọhia ọsu-ákwà. 18 Ha we kpọ eze òkù, Elaiakim nwa Hilkaia, nke bu onye-isi ulo, na Shebna, bú ode-akwukwọ, na Joa nwa Esaf, bú onye-ncheta, we pukuru ha. 19 Rabshake we si ha, Biko, sinu Hezekaia, Otú a ka eze uku ahu siri, bú eze Asiria, Gini bu ntukwasi-obi a nke i ji tukwasi obi? 20 I nāsi, (ma ọ bu nání okwu eb͕ub͕ere-ọnu) Ndum-ọdu na idi-ike di iji bu agha. Ub͕u a ònye ka i tukwasiworo obi, na i nupuwo isi n'okpurum? 21 Ub͕u a, le, i tukwasiworo onwe-gi obi n'aru nkpa-n'aka amì a piara apia, bú n'aru Ijipt, nke nwoke nādabere na ya, o we ba n'ọbu-aka-ya, dua ya: otú a ka Fero, bú eze Ijipt, di n'ebe ndi nile nātukwasi ya obi nọ. 22 Ma ọ buru na unu asim, Ọ bu Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi tukwasiworo obi: ọ̀ bughi Onye ahu bu onye Hezekaia wezugara ebe nile Ya di elu na ebe-ichu-àjà-ya nile, si Juda, si kwa Jerusalem, N'iru ebe-ichu-àjà nka ka unu gākpọ isi ala nime Jerusalem? 23 Ma ub͕u a, biko, were onwe-gi mere onye-nwem, bú eze Asiria, ihe-ibe, ka m'nye kwa gi nnù inyinya ise, ọ buru na i puru inyere onwe-gi ndi gānọkwasi ha. 24 Ì gēsi kwa aṅa chighari iru otù onye-ọchi-agha nke ndi-orù onye-nwem ndi kachasi ntà, tukwasiri onwe-gi obi n'aru Ijipt inwe ub͕ọ-ala na ndi-inyinya? 25 Ub͕u a ọ̀ bu n'ejighi Jehova ka m'rigoro imegide ebe a ibibi ya? 26 Jehovah sirim, Rigo imegide ala nka, bilie ya. Elaiakim nwa Hilkaia, na Shebna, na Joa, we si Rabshake, Biko, gwa ndi orù-gi okwu n'asusu Siria; n'ihi na ayi onwe-ayi nānu ya: akpaye-kwa-la ayi uka n'asusu ndi-Ju, na nti ndi nọ n'elu mb͕idi. 27 Rabshake we si ha, Ọ̀ bu n'ihi onye-nwe-gi na ijekuru gi ka onye-nwem ziterem ikwu okwu ndia? ọ̀ bughi n'ihi ndikom ahu ndi nānọdu n'elu mb͕idi, ka ha we soro unu rie ǹsí-ha ṅu kwa nwa-miri-ha? 28 Rabshake we guzo, were oké olu kpọ n'asusu ndi-Ju, kwue, si, Nurunu okwu eze uku ahu, bú eze Asiria. 29 Otú a ka eze siri, Unu ekwela ka Hezekaia rafue unu; n'ihi na ọ pughi inaputa unu n'aka-ya: 30 unu ekwe-kwa-la ka Hezekaia me ka unu tukwasi Jehova obi, si, Jehova aghaghi inaputa ayi, agaghi-enye kwa obodo a n'aka eze Asiria. 31 Unu egela Hezekaia nti: n'ihi na otú a ka eze Asiria siri, Merenum ihe-ngọzi, pukutekwam; ri-kwa-nu, nwoke ọ bula nkpuru vine-ya, na nwoke ọ bula nkpuru osisi fig ya, ṅu-kwa-nu, nwoke ọ bula miri olùlù-miri-ya; 32 rue mb͕e m'biara chiri unu je n'ala dika ala-unu, bú ala ọka na manya-vine ọhu, ala achicha na ubi-vine, ala manu olive na manu-aṅu, ka unu we di ndu, ghara inwu: unu ege-kwa-la Hezekaia nti, mb͕e ọ nārafu unu, si, Jehova gānaputa ayi. 33 Chi nile nke mba nile ọzọ, hà anaputawo, onye ọ bula ala-ya, n'aka eze Asiria ma-ọli? 34 Òle ebe chi nile nke Hemat na Apad di? òle ebe chi nile nke Sefavaim na Hina na Iva di? hà anaputawo Sameria n'akam? 35 Òle ndi n'etiti chi nile nke ala dum ka ha bu, bú ndi naputara ala-ha n'akam, na Jehova gānaputa Jerusalem n'akam? 36 Ma ndi-Ju b͕ara nkiti, ha azaghi kwa ya okwu: n'ihi na ihe eze nyere n'iwu bu nka, si, Unu azala ya. 37 Elaiakim nwa Hilkaia, nke bu onye-isi ulo, na Shebna, bú ode-akwukwọ, na Joa nwa Esaf, bú onye-ncheta, we biakute Hezekaia, ha na uwe-ha dọwara adọwa, ha we gosi ya okwu nile nke Rabshake.

2 Ndi-Eze 19

1 O rue, mb͕e eze, bú Hezakaia, nuru ya, na ọ dọwara uwe-ya nile, were ákwà-nkpe kpuchie onwe-ya, ba n'ulo Jehova. 2 O we zìe Elaiakim, nke bu onye-isi ulo, na Shebna, bú ode-akwukwọ, na ndi-okenye ndi-nchu-àjà, ndi wereworo ákwà-nkpe kpuchie onwe-ha, o we zìe ha jekuru Aisaia, bú onye-amuma, nwa Emoz. 3 Ha we si ya, Otú a ka Hezekaia siri, Ubọchi ahuhu na iba-nba na nlelì-anya ka ubọchi ta bu: n'ihi na umu abiaruwo ebe-nmuputa, ma ike adighi imu ha. 4 Eleghi anya Jehova, bú Chineke-gi, gānu okwu nile nke Rabshake, onye eze Asiria, bú onye-nwe-ya, ziteworo ita Chineke di ndu uta, eleghi anya ọ gābara okwu nile nke Jehova, bú Chineke-gi, nuworo nba: buli kwa ekpere-gi n'ihi ndi fọduru ndi ahutaworo. 5 Ndi-orù eze, bú Hezekaia, we biakute Aisaia. 6 Aisaia we si ha, Otú a ka unu gāsi onye-nwe-unu, Otú a ka Jehova siri, Atula egwu n'ihi okwu nile nke i nuworo, nke ndi nējere eze Asiria ozi jiri kwulum. 7 Le, M'nētiye otù mọ nime ya, ọ gānu kwa akukọ, laghachi n'ala-ya; M'gēme kwa ka ọ da site na mma-agha n'ala-ya. 8 Rabshake we laghachi, huta eze Asiria ka o nēbuso Libna agha: n'ihi na ọ nuru na o siwo na Lekish bulie ije. 9 O we nu ihe bayere Tiahaka, bú eze Etiopia, si, Le, ọ putawo ibuso gi agha: o we zìe ndi-ozi jekuru Hezekaia ọzọ, si, 10 Otú a ka unu gāgwa Hezekaia, bú eze Juda, okwu, si, Ekwela ka Chineke-gi, Onye gi onwe-gi nātukwasi obi, rafue gi, si Agaghi-enye Jerusalem n'aka eze Asiria. 11 Le, gi onwe-gi anuwo ihe ndi-eze Asiria meworo ala nile, n'iwezuga ha ka ebibie ha: àgānaputa kwa gi onwe-gi? 12 Chi nile nke mba nile ọzọ hà anaputawo ha, bú ndi nnam-hà bibiworo, Gozan, na Haran, na Rezef, na umu Edem, ndi nọ na Telasa? 13 Òle ebe eze Hemat di, na eze Apad, na eze obodo Sefavaim na Hina na Iva? 14 Hezekaia we nata akwukwọ n'aka ndi-ozi ahu, gua ha: Hezekaia we rigorue ulo Jehova, b͕asa ya n'iru Jehova. 15 Hezekaia we kpe ekpere n'iru Jehova, si, Jehova, bú Chineke Israel, Onye nēbi n'etiti cherubim, Gi onwe-gi bu Chineke, nání Gi, nke ala-eze nile nke uwa; Gi onwe-gi mere elu-igwe na uwa. 16 Jehova, tọ nti-Gi n'ala, nu; Jehova, saghe anya-Gi abua, hu: nu kwa okwu nile nke Senakerib, nke o jiri zite ya ita Chineke di ndu uta. 17 N'ezi-okwu, Jehova, ndi-eze Asiria emewo ka mba nile na ala nile ha tọb͕ọrọ n'efu, 18 ha etiyewo kwa chi nile ha n'ọku, n'ihi na ọ bughi chi ka ha bu, kama ha bu ọlu aka madu, bú osisi na nkume; ha we me ka ha la n'ihì. 19 Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke-ayi, biko, zọputa ayi n'aka-ya, ka ala-eze nile nke uwa we mara na Gi onwe-gi bu Jehova, bú Chineke, nání Gi. 20 Aisaia nwa Emoz we zigara Hezekaia ozi, si, Otú, a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Ekpere nke i kpeworom bayere Senakerib, bú eze Asiria, anuwom ya. 21 Nka bu okwu nke Jehova kwuworo bayere ya: Nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú ada Zaion, elelìwo gi anya, chìnye gi ihere n'iru; ada Jerusalem efufewo isi n'azu gi. 22 Ònye ka i taworo uta, kwulu kwa? Ònye ka i mewo-kwa-ra olu-gi ka ọ di elu, weli kwa anya-gi abua imegide Ya? ọ bu imegide Onye Nsọ nke Israel. 23 I siri n'aka ndi-ozi-gi ta Onye-nwe-ayi uta, si, Ọtutu ub͕ọ-alam ka mu onwem jiri rigorue ebe di elu nke ugwu ime, rue akuku nile Lebanon; m'gēb͕utu kwa osisi cedar ya nile toro ogologo, na osisi fir ya nile arọputara arọputa: m'gābà kwa n'ebe-nnọdu-abali nke nsọtu-ya, oké ọhia nke ubi ọma ya. 24 Mu onwem egwuwo olùlù-miri, ṅua miri ala ọzọ, m'gēwere kwa ọbu-ukwu nke nzọli-ukwum me ka osimiri Nail nile nke Ijipt tasia. 25 Ì nughi na ọ bu na mb͕e di anya gara aga ka M'meworo ya, na ọ bu n'ubọchi mb͕e ochie ka M'kpuworo ya? ub͕u a emewom ka ọ biarue, na i gābu onye gākwada obodo ewusiri ike ka ha we ghọ obo tọb͕ọrọ n'efu. 26 Ndi bi nime ha we ghọ ndi aka-ha di nkpunkpu, ha turu ujọ ihere we me ha; ha ghọrọ ihe-ọkukú nke ubi, na akwukwọ ahihia ndu, na ahihia nke elu-ulo, na ọka chanwuru achanwu tutu o tolite. 27 Ma amawom nnọdu-gi, na ọpupu-gi, na nbata-gi, na otú i nākpali onwe-gi imegidem. 28 N'ihi na i nākpali onwe-gi imegidem, na n'ihi na npako-gi arigowo ba na ntim abua, M'gētiye kwa nb͕a-aka-imim n'imi-gi, na bridle nkem n'eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua, me ka i laghachi n'uzọ ahu nke i siri bia. 29 Ma nka gāburu gi ihe-iriba-ama: unu gēri n'arọ a ihe nēpu n'onwe-ya, na n'arọ nke-abua ihe si na nke ahu pue; ma n'arọ nke-atọ ghanu nkpuru, we kwa ihe ubi, ku kwa vine n'ubi-vine, ri kwa nkpuru-ha. 30 Ndi b͕apuru ab͕apu nke ulo Juda ndi fọduru gāb͕agide kwa nkpọrọgwu n'ala n'okpuru ọzọ, mi kwa nkpuru n'elu. 31 N'ihi na ọ bu na Jerusalem ka ndi fọduru afọdu gēsi puta, ndi b͕apuru ab͕apu gāputa kwa n'ugwu Zaion: ekworo Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēme nka. 32 N'ihi ya ka Jehova kwuru okwu bayere eze Asiria otú a, si, Ọ gaghi-abà n'obodo a, ọ gaghi-ab͕a kwa otú àkú n'ebe ahu, ọ gaghi-ewere kwa ọta bia n'iru ya, ọ gaghi-awukọta kwa ihe-ntukọba imegide ya. 33 N'uzọ o siri bia, n'uzọ ahu ka ọ gālaghachi, ọ gaghi-abà kwa n'obodo a, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 34 M'gēb͕ochi kwa obodo a izọputa ya, n'ihi Onwem, na n'ihi Devid, bú orùm. 35 O rue, n'abali ahu, na mọ-ozi nke Jehova puru, tib͕ue n'ọmuma-ulo-ikwū Asiria orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ atọ na nnù ndikom abua na ọgu iri: madu we bilie n'isi-ututu, ma, le, ha nile bu ozu nwuru anwu. 36 Senakerib, bú eze Asiria, we bulie ije, je, laghachi, biri na Nineve. 37 O rue, mb͕e ya onwe-ya nākpọ isi ala n'ulo Nisrok, bú chi-ya, na Adramelek na Shareza, bú umu-ya ndikom, were mma-agha tib͕ue ya: ma ndi ahu wepugara onwe-ha la n'ala Ararat. Isa-hadon nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

2 Ndi-Eze 20

1 Na mb͕e ahu Hezekaia riara ọria inwu anwu. Aisaia, bú onye-amuma, bú nwa Emoz, we biakute ya, si ya, Otú a ka Jehova siri, Nye ulo-gi iwu; n'ihi na gi onwe-gi nānwu anwu, i gaghi-adi kwa ndu. 2 O we chigharia iru-ya che mb͕idi iru, kpere Jehova, si, 3 Biko, Jehova, biko, cheta otú m'jeghariworo n'iru Gi n'ezi-okwu na n'obi zuru okè, ọ bu kwa ihe di nma n'anya-Gi ka m'meworo. Hezekaia we kwa ákwá nke-uku. 4 O rue, mb͕e Aisaia akāpughi ba n'etiti obodo, na okwu Jehova ruru ya nti, si, 5 Jeghachi, si Hezekaia, bú onye-ndú ndim, Otú a ka Jehova, bú Chineke Devid nna-gi, siri, Anuwom ekpere-gi, ahuwom anya-miri-gi: le, M'nēme ka aru-gi di ike: n'ubochi nke-atọ i gārigoru ulo Jehova. 6 M'gātukwasi kwa arọ iri na ise n'ubọchi-gi, naputa kwa gi na obodo a n'ọbu-aka eze Asiria, b͕ochi kwa obodo a n'ihi Onwem na n'ihi Devid, bú orùm. 7 Aisaia we si, Werenu mbadamba fig. Ha we were ya tukwasi ya n'elu ihe-ofifi ahu, o we diri ndu. 8 Hezekaia we si Aisaia, Gini gābu ihe-iriba-ama na Jehova gēme ka arum di ike, m'we rigorue ulo Jehova n'ubọchi nke-atọ? 9 Aisaia we si, Nka gāburu gi ihe-iriba-ama sitere n'aka Jehova, na Jehova gēme ihe a nke O kwuru: onyinyo, ọ̀ gāga n'iru nzọ-ukwu ebe-nrigo iri, ma-ọbu la azu nzọ-ukwu ebe-nrigo iri? 10 Hezekaia we si, Ọ di nfe ka onyinyo ruru nzọ-ukwu ebe-nrigo iri: é-è, kama ka onyinyo la azu nzọ-ukwu ebe-nrigo iri. 11 Aisaia, bú onye-amuma, we kpọkue Jehova: O we me ka onyinyo la azu nzọ-ukwu ebe-nrigo iri, nke ọ ridara na nzọ-ukwu ebe-nrigo Ehaz. 12 Na mb͕e ahu Berodak-baladan nwa Baladan, bú eze Babilon, zigara Hezekaia akwukwọ na onyinye-inata-iru-ọma: n'ihi na ọ nuru na Hezekaia riarárí ọria. 13 Hezekaia we ge ha nti, me ka ha hu ulo nile nke ihe-ya di oké ọnu-ahia, bú ọla-ọcha-ya, na ọla-edo-ya, na uda-ya di iche iche, na ezi manu-ya, na ulo ihe-agha-ya nile, na ihe nile nke achọtara n'àkù-ya nile: ọ dighi ihe di n'ulo-ya, ma-ọbu n'ala nile ọ nāchi, nke Hezekaia nēmeghi ka ha hu. 14 Aisaia, bú onye-amuma, we biakute eze, bú Hezekaia, si ya, Gini ka ndikom ndia siri gi? òle ebe ka ha si kwa biakute gi? Hezekaia we si, Ọ bu n'ala di anya ka ha si bia, bú Babilon. 15 Ọ si, Gini ka ha huru n'ulo-gi? Hezekaia we si, Ihe nile nke di n'ulom ka ha huru: ọ dighi ihe di n'àkùm nile nke m'nēmeghi ka ha hu. 16 Aisaia we si Hezekaia, Nuru okwu Jehova. 17 Le, ubọchi nābia, na ihe nile di n'ulo-gi, na nke nna-gi-hà debeworo n'ulo-àkù rue ta, agēburu ha je Babilon: ọ dighi ihe gāfọdu, ka Jehova siri. 18 Ufọdu kwa nime umu-gi ndikom, ndi gēsi n'aru-gi puta, ndi i gāmuta, ha gāchiri ha; ha gābu kwa ndi-onozi n'ulo uku eze Babilon. 19 Hezekaia we si Aisaia, Ọ di nma, bú okwu Jehova nke i kwuworo. Ọ si kwa, Ọ̀ bughi otú a, ma ọ buru na udo na ezi-okwu adi n'ubọchim nile? 20 Ma ihe nile Hezekaia mere nke fọduru, na idi-ike-ya nile, na otú o mere ọdọ-miri, na uzọ-miri, we me ka miri rubata n'obodo, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda? 21 Hezekaia we so nna-ya-hà dina n'ọnwu: Manase nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

2 Ndi-Eze 21

1 Manase b͕ara arọ iri na abua mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze ọgu arọ abua na iri na ise nime Jerusalem: aha nne-ya bu Hefzi-ba. 2 O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di, bú ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel. 3 Ebe di elu nke Hezekaia nna-ya mere ka ha la n'iyì, o wue ha ọzọ; o guzo-kwa-ra ebe-ichu-àjà nye Beal, me kwa Ashera, dika Ehab, bú eze Israel, mere, ọ kpọ isi ala nye usu nile nke ihe elu-igwe, fè ha òfùfè. 4 O wu-kwa-ra ebe-ichu-àjà di iche n'ulo Jehova, nke Jehova siri, Nime Jerusalem ka M'gētiye aham. 5 O wu-kwa-ra ebe-ichu-àjà nye usu nile nke ihe elu-igwe n'ogige abua nke ulo Jehova. 6 O me-kwa-ra ka nwa-ya mwoke gabiga nime ọku, o ji-kwa-ra igwe-oji tu isi ọma na isi ọjọ, ọ b͕a-kwa-ra afa, meso kwa onye nāju mọ ihe, na ndi-dibia-afa: o mere ihe jọrọ njọ n'anya Jehova ri nne, ikpasu Ya iwe. 7 Ọ dọba-kwa-ra arusi apiri api nke Ashera, bú nke o mere, n'ulo ahu nke Jehova siri Devid, si kwa Solomon nwa-ya, N'ulo a, na nime Jerusalem, nke M'rọputaworo n'ebo nile nke Israel, ka M'gētiye aham rue mb͕e ebighi-ebi: 8 M'gaghi-eme kwa ka ukwu Israel si n'ala nke M'nyere ndi bu nna-ha waghari ọzọ; nání ọ buru na ha elezi anya ime dika ihe nile si di nke M'nyeworo ha n'iwu, na dika iwu nile si di nke orùm, bú Moses, nyēre ha n'iwu. 9 Ma ha anugh: Manase we me ka ha sihie uzọ ime ihe ọjọ kari mba ọzọ, bú ndi Jehova kpochapuru n'iru umu Israel. 10 Jehova we kwue site n'aka ndi-orù-Ya, bú ndi-amuma, si, 11 N'ihi na Manase, bú eze Juda, emewo ihe-árú ndia, we me ihe ọjọ kari ihe nile nke ndi-Amorait mere, ndi buru ya uzọ, o we were arusi-ya nile me ka Juda mehie kwa: 12 n'ihi ya otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Le, M'nēme ka ihe ọjọ biakwasi Jerusalem na Juda, nke nti abua nke onye ọ bula nānu gāzu wuruwuru. 13 M'gēseti kwa n'elu Jerusalem eriri Sameria na ihe-ọtùtù ulo Ehab: M'gēhicha kwa Jerusalem dika madu si ehicha ọkwa, nēhicha ya, nēkpùta ya iru. 14 M'gārapu kwa ndi fọduru nke ihe-nketam, nye ha n'aka ndi-iro-ha; ha gāghọ-kwa-ra ndi-iro-ha nile ihe-nluta-n'agha na ihe ha nānara n'ike; 15 n'ihi na ha emewo ihe jọrọ njọ n'anyam, ha nākpasukwam ìwe, site n'ubọchi ndi bu nna-ha siri n'Ijipt puta, we rue ta. 16 Ọzọ kwa, Manase wusiri ọbara nke-uku ri nne, bú nke nēmeghi ihe ọjọ, rue mb͕e o mejuru Jerusalem site n'otù ọnu-uzọ-ama rue ọnu-uzọ-ama ọzọ; nāgughi nmehie-ya nke o jiri me ka Juda mehie, ime ihe jọrọ njọ n'anya Jehova. 17 Ma okwu Manase nile nke fọduru, na ihe nile o mere, na nmehie-ya nke o mehiere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda? 18 Manase we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'ubi ulo-ya ab͕ara ogige, n'ubi Uza ab͕ara ogige: Emon nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya. 19 Emon b͕ara orú arọ na abua mb͕e o malitere ibu eze; o we buru eze arọ abua nime Jerusalem: aha nne-ya bu Meshulemet nwa Haruz nke Jọtba. 20 O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika Manase, bú nna-ya, mere. 21 O we je ije n'uzọ nile nke nna-ya jere, o we fè arusi òfùfè nke nna-ya fère, ọ kpọ isi ala nye ha: 22 o we rapu Jehova, bú Chineke nna-ya-hà, ọ jeghi kwa ije n'uzọ Jehova. 23 Ndi-orù Emon we kekọta onwe-ha imegide ya, ha we me ka eze nwua n'ulo-ya. 24 Ndi ala ahu we tib͕ue ndi nile nēkekọta onwe-ha imegide eze, bú Emon; ndi ala ahu we me Josaia nwa-ya eze n'ọnọdu ya. 25 Ma ihe nile nke Emon mere nke fọduru, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda? 26 Ewe lìe ya n'ílì-ya n'ubi Uza ab͕ara ogige: Josaia nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

2 Ndi-Eze 22

1 Josaia b͕ara arọ asatọ mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze orú arọ na iri na otù nime Jerusalem: aha nne-ya bu Jedida nwa Adaia nke Bọkzat. 2 O me ihe ziri ezi n'anya Jehova, je ije n'uzọ nile nke Devid nna-ya, o wezugaghi kwa onwe-ya n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe. 3 O rue, n'arọ nke-iri-na-asatọ nke eze Josaia, na eze zigara Shefan nwa Azalaia, nwa Meshulam, bú ode-akwukwọ, n'ulo Jehova, si, 4 Rigokuru Hilkaia, bú onye-isi-nchu-àjà, ka o we guzù ego ahu nke anēwebata n'ulo Jehova, nke ndi nēche nbata-uzọ chikọtaworo n'aka ndi Israel: 5 ka ha nye kwa ya n'aka ndi nēje ozi ahu, bú ndi nēlekọta ihe n'ulo Jehova: ka ha nye kwa ya n'aka ndi nēje ozi nke di n'ulo Jehova, iji me ka ebe etipúru etipú di ike; 6 ka ha nye ya n'aka ndi-ọ̀kà n'osisi, na n'aka ndi nēwu ulo, na n'aka ndi nēdo nkume; na iji zuta osisi na nkume awara awa ime ka ulo ahu di ike. 7 Nání na ha na ndi ahu agughi ego nke anēnye n'aka-ha; n'ihi na ọ bu n'ikwesi-ntukwasi-obi ka ndi ahu nēme ihe. 8 Hilkaia, bú onye-isi-nchu-àjà, we si Shefan, bú ode-akwukwọ, Achọtawom akwukwọ iwu ahu n'ulo Jehova. Hilkaia we nye Shefan akwukwọ ahu, ọ gua ya. 9 Shefan, bú ode-akwukwọ, we biakute eze, weghachiri eze okwu, si, Ndi-orù-gi awupuwo ego ahu nke anāchọta n'ulo ahu, ha we nye ya n'aka ndi nēje ozi ahu, bú ndi nēlekọta ulo Jehova. 10 Shefan, bú ode-akwukwọ, we gosi eze, si, Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, enyewom otù akwukwọ. Shefan we gua ya n'iru eze. 11 O rue, mb͕e eze nuru okwu nile nke akwukwọ iwu ahu, na ọ dọwara uwe-ya nile. 12 Eze we nye Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, na Ahaikam nwa Shefan, na Akboa nwa Maikaia, na Shefan, bú ode-akwukwọ, na Asaia, bú orù eze, iwu, si, 13 Jenu, juaram Jehova ase, ju-kwa-ra ndi nkem, ju-kwa-ra Juda nile, bayere okwu nile nke akwukwọ a nke achọtaworo: n'ihi na ọnuma Jehova di uku, bú nke amuyeworo dika ọku megide ayi, n'ihi na nna-ayi-hà egeghi okwu nile nke akwukwọ a nti, ime dika ihe si di nke edeworo n'ihi ayi. 14 Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, na Ahaikam, na Akboa, na Shefan, na Asaia, we jekuru Hulda, bú onye-amuma-nwayi, nwunye Shalum nwa Tikva, nwa Hahas, onye nēdebe uwe ndi-nchu-àjà; (ma nwayi ahu nēbi na Jerusalem n'obodo nke-abua; ) ha we gwa ya okwu. 15 Ọ si ha, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri: Sinu nwoke ahu nke ziri unu biakutem, 16 Otú a ka Jehova siri, Le, M'nēme ka ihe ọjọ biarue ebe a, biakwasi kwa ndi bi nime ya, bú okwu nile nke akwukwọ ahu nke eze Juda guworo: 17 n'ihi na ha arapuwom, we surere chi di iche iche ọzọ ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ ka ha we were ọlu nile nke aka-ha kpasuem iwe; ewe muye ọnumam dika ọku megide ebe a, agaghi-emenyu kwa ya. 18 Ma eze Juda, onye nēzite unu iju Jehova ase, otú a ka unu gāsi ya, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri: Okwu ndia nke i nuworo, 19 n'ihi na obi-gi di nrò, i we ruru ala n'iru Jehova, mb͕e i nuru ihe M'kwuru megide ebe a, megide kwa ndi bi nime ya, na ha gāghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu na ihe-nkọcha, i we dọwa uwe-gi nile, kwa ákwá n'irum; Mu onwem anuwo kwa, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 20 N'ihi ya, le, M'gāchikọta gi na nna-gi-hà n'ala-mọ agāchikọta kwa gi na ndi ọzọ je n'ílì-gi n'udo, anya-gi agaghi-ele kwa ihe ọjọ a nile nke Mu onwem nēme ka ọ biakwasi ebe a. Ha we weghachiri eze okwu.

2 Ndi-Eze 23

1 Eze we ziga, ha we chikọta ndi-okenye nile nke Juda na Jerusalem n'ebe ọ nọ. 2 Eze we rigorue ulo Jehova, ya na ndikom nile nke Juda, na ndi nile ndi bi na Jerusalem, na ndi-nchu-àjà, na ndi-amuma, na ndi Juda nile, site n'onye ntà we rue onye uku: o we gua na nti-ha okwu nile nke akwukwọ ọb͕ub͕a-ndu ahu nke achọtaworo n'ulo Jehova. 3 Eze we guzo n'akuku ogidi, b͕a ndu n'iru Jehova, ijeso Jehova, na iwere obi-ya nile na nkpuru-obi-ya nile debe ihe nile O nyere n'iwu, na ihe-àmà-Ya nile, na ukpuru-Ya nile, ime ka okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu nka nke edeworo n'akwukwọ a guzosie ike: ndi Juda nile we guzo n'ọb͕ub͕a-ndu ahu. 4 Eze we nye Hilkaia, bú onye-isi-nchu-àjà, na ndi-nchu-àjà nke usoro nke-abua, na ndi nēche nbata-uzọ, iwu, isi n'ulo Jehova weputa ihe nile nke emeworo nye Beal, nye kwa Ashera, nye kwa usu nile nke ihe elu-igwe: o we sure ha ọku n'azu Jerusalem n'ọhia Kidron, būru ntu-ha je Bet-el. 5 O me-kwa-ra ndi-nchu-àjà arusi kwusi, bú ndi-eze Juda doro isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe nile di elu n'obodo Juda nile, na n'ebe di Jerusalem buruburu; o me-kwa-ra ka ndi ahu kwusi, bú ndi nēsurere Beal, na anyanwu, na ọnwa, na kpakpando nējeghari ejeghari, na usu nile nke ihe elu-igwe, ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ. 6 O si-kwa-ra n'ulo Jehova buputa Ashera je n'azu Jerusalem, rue miri-iyi Kidron, sure ya ọku n'akuku miri-iyi Kidron, supia ya me ka ọ di ka uzuzu, kpofue uzuzu-ya n'elu ílì ndi efu. 7 Ọ kwatu-kwa-ra ulo nile nke ndi edoro nsọ ikwa iko, nke di n'ulo Jehova, ebe ndinyom nākpara Ashera ulo-ikwū. 8 O me-kwa-ra ka ndi-nchu-àjà nile si n'obodo Juda nile bia, o meru-kwa-ra ebe nile di elu ebe ndi-nchu-àjà surere ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, site na Geba rue Bia-sheba; ọ kwatu-kwa-ra ebe nile di elu nke ọnu-uzọ-ama nke di n'oghere ọnu-uzọ-ama Joshua, bú onye-isi obodo, nke di n'aka-ekpe madu n'ọnu-uzọ-ama obodo. 9 Nání na ndi-nchu-àjà nke ebe nile di elu adighi-arigo n'ebe-ichu-àjà Jehova nime Jerusalem, ma ha nēri achicha ekoghi-eko n'etiti umu-nne-ha. 10 O meru-kwa-ra Tofet, nke di na ndagwurugwu umu Hinom, ka nwoke ọ bula we ghara ime ka nwa-ya nwoke ma-ọbu nwa-ya nwayi gabiga nime ọku rue Molek. 11 O me-kwa-ra ka inyinya nile kwusi, bú nke ndi-eze Juda nyere anyanwu, nime nbata ulo Jehova, n'akuku ime-ulo Netan-melek, bú onozi, nke di n'èzí ulo ahu; o sure-kwa-ra ub͕ọ-ala nile nke anyanwu n'ọku. 12 Ebe-ichu-àjà nile nke di n'elu ime-ulo-elu nke Ehaz, nke ndi-eze Juda mere, na ebe-ichu-àjà nile nke Manase mere n'ogige abua nke ulo Jehova, eze kwaturu ha, we si n'ebe ahu b͕a ọsọ, kpofue uzuzu-ha nime miri-iyi Kidron. 13 Ebe nile di elu nke di n'iru Jerusalem, nke di n'aka-nri ugwu nbibi, nke Solomon, bú eze Israel, wuru nye Ashtoret, bú ihe-árú ndi Zaidon, nye kwa Kemosh, bú ihe-árú Moab, nye kwa Milkom, bú ihe-árú umu Amon, eze meru-kwa-ra ha. 14 O tipia-kwa-ra ogidi nile, b͕utu kwa Asherim, were ọkpukpu madu mejue ọnọdu-ha. 15 Ọzọ kwa, ebe-ichu-àjà nke di na Bet-el, na ebe di elu nke Jeroboam nwa Nebat mere, bú onye mere ka Israel mehie, ọbuná ebe-ichu-àjà ahu na ebe ahu di elu ka ọ kwaturu; o sure ebe ahu di elu ọku, supia ya me ka ọ ghọ uzuzu, sure kwa Ashera ọku. 16 Josaia we chigharia onwe-ya, hu ílì nile nke di n'ebe ahu n'ugwu ahu; o we zìe, chipu ọkpukpu n'ílì nile, sure ha ọku n'elu ebe-ichu-àjà ahu, merua ya, dika okwu Jehova si di nke onye nke Chineke ahu kpọsara, bú onye kpọsara ihe ndia. 17 O we si, Gini bu ihe-iriba-ama ahu nke mu onwem nāhu? Ndikom obodo ahu we si ya, Ọ bu ílì onye nke Chineke, onye siri na Juda bia, kpọsa ihe ndia nke i meworo megide ebe-ichu-àjà Bet-el. 18 Ọ si, Ya nọduru onwe-ya; ka nwoke ọ bula ghara ichipu ọkpukpu-ya. Ha we rapu ọkpukpu-ya, ha na ọkpukpu onye-amuma ahu nke siri na Sameria bia. 19 Ọzọ kwa, ulo nile nke ebe nile di elu, nke di n'obodo nile nke Sameria, nke ndi-eze Israel mere ikpasu Jehova iwe, ha ka Josaia wezugara, me kwa ha dika omume nile si di nke o mere na Bet-el. 20 O b͕ue ndi-nchu-àjà nile nke ebe nile di elu nke di n'ebe ahu, n'elu ebe-ichu-àjà nile, o sure-kwa-ra ọkpukpu madu n'elu ha; o we laghachi na Jerusalem. 21 Eze we nye ndi Juda nile iwu, si, Merenu Jehova, bú Chineke-unu, ememe ngabiga, dika edeworo ya n'akwukwọ ọb͕ub͕a-ndu nka. 22 N'ezie emeghi ememe ngabiga dika ememe ngabiga nka site n'ubọchi ndi-ikpe ndi kpere Israel, ọbuná ubọchi nile nke ndi-eze Israel, na nke ndi-eze Juda; 23 ma ọ bu n'arọ nke-iri-na-asatọ nke eze, bú Josaia, ka emere ememe ngabiga nka nye Jehova nime Jerusalem. 24 Ọzọ kwa, ndi nāju mọ ihe, na ndi-dibia-afa, na teraphim, na arusi nile, na ihe-árú nile nke ahuru n'ala Juda, na nime Jerusalem, ndia ka Josaia tkpochapuru, ka o we me ka okwu nile nke iwu guzosie ike, bú nke edeworo n'akwukwọ nke Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, chọtara n'ulo Jehova. 25 Ọ dighi eze nke buru ya uzọ di ka ya, onye were obi-ya nile, were kwa nkpuru-obi-ya nile, were kwa ike-ya nile, chigharikute Jehova, dika iwu nke Moses si di; ọ dighi kwa onye ọzọ dika ya biliri mb͕e ọ nwusiri. 26 Otú ọ di, Jehova esighi n'idi-ọku iwe uku Ya laghachi, nke iwe-Ya ji di ọku megide Juda, n'ihi nkpasu-iwe nile nke Manase kpasuru Ya. 27 Jehova we si, M'gēsi kwa n'irum wezuga Juda, dika M'wezugara Israel, M'gāju kwa obodo a nke M'rọputaworo, bú Jerusalem, na ulo ahu nke M'siri, Aham gādi n'ebe ahu. 28 Ma okwu Josaia nile nke fọduru, na ihe nile nke o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda? 29 N'ubọchi-ya ka Fero-neko, bú eze Ijipt, rigoro imegide eze Asiria rue osimiri Yufretis: eze, bú Josaia, we je izute ya; o we me ka ọ nwua na Megido, mb͕e ọ huru ya. 30 Ndi-orù-ya we si na Megido buru ya nime ub͕ọ-ala mb͕e ọ nwuru anwu, ha we bubata ya na Jerusalem, lìe ya n'ílì-ya. Ndi ala ahu we kuru Jehoahaz nwa Josaia, te ya manu, me ya eze n'ọnọdu nna-ya. 31 Jehoahaz b͕ara orú arọ na atọ mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze ọnwa atọ nime Jerusalem: aha nne-ya bu Hamutal nwa Jeremaia nke Libna. 32 O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika ihe nile si di nke nna-ya-hà mere. 33 Fero-neko we ke ya ab͕u nime Ribla n'ala Hemat, ka o we ghara ibu eze nime Jerusalem; o we tukwasi ala ahu nra, bú ọgu talent ọla-ọcha ise, na otù talent ọla-edo. 34 Fero-neko we me Elaiakim nwa Josaia eze n'ọnọdu Josaia nna-ya, gugharia ya aha Jehoiakim: ma o wepuru Jehoahaz; ọ biarue Ijipt, nwua n'ebe ahu. 35 Jehoiakim we nye Fero ọla-ọcha na ọla-edo ahu; nání na ọ ruru ala ọnu inye ego n'okwu-ọnu Fero: o were ihe-ike nara ndi ala ahu ọla-ọcha na ọla-edo, nwoke ọ bula dika ọ̀rùrù-ọnu-ya si di, inye ya Fero-neko. 36 Jehoiakim b͕ara orú arọ na ise mb͕e ọ malitere ibu eze, o we buru eze arọ iri na otù nime Jerusalem: aha nne-ya bu Zebida nwa Pedaia nke Ruma. 37 O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika ihe nile si di nke nna-ya-hà mere.

2 Ndi-Eze 24

1 N'ubọchi-ya Nebukadneza, bú eze Babilon, rigoro, Jehoiakim we ghọrọ ya orù arọ atọ: o we chigharia nupu isi n'okpuru ya. 2 Jehova we zìe usu ndi nāpunara madu ihe nke ndi Kaldea, na usu ndi nāpunara madu ihe nke Siria, na usu ndi nāpunara madu ihe nke Moab, na usu ndi nāpunara madu ihe nke umu Amon, imegide ya, o zì-kwa-ra ha imegide Juda ime ka ọ la n'iyì, dika okwu Jehova si di, nke O kwuru site n'aka ndi-orù-Ya, bú ndi-amuma. 3 N'ezie n'okwu-ọnu Jehova ka ihe a di n'aru Juda, isi n'iru Ya wezuga ha, n'ihi nmehie nile nke Manase, dika ihe nile si di nke o mere; 4 ọzọ kwa, n'ihi ọbara nēmeghi ihe ọjọ nke ọ wusiri; o we mejue Jerusalem n'ọbara nēmeghi ihe ọjọ: Jehova ekweghi kwa ib͕aghara. 5 Ma okwu Jehoiakim nile fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda? 6 Jehoiakim we so nna-ya-hà dina n'ọnwu: Jehoiakin nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya. 7 Ma eze Ijipt esighi n'ala-ya puta ọzọ ma-ọli: n'ihi na eze Babilon ewerewo ihe nile eze Ijipt nwere site na miri-iyi Ijipt rue osimiri Yufretis. 8 Jehoiakin b͕ara arọ iri na asatọ mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze nime Jerusalem ọnwa atọ: aha nne-ya bu Nehushta nwa Elnetan nke Jerusalem. 9 O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika ihe nile si di nke nna-ya mere. 10 Na mb͕e ahu ka ndi-orù Nebukadneza, bú eze Babilon, rigoruru Jerusalem, ewe nọchigide obodo ahu n'agha. 11 Nebukadneza, bú eze Babilon, we biarue obodo ahu, mb͕e ndi-orù-ya nānọchigide ya n'agha; 12 Jehoiakin, bú eze Juda, we pukuru eze Babilon, ya onwe-ya, na nne-ya, na ndi-orù-ya, na ndi-isi-ya, na ndi-onozi-ya: eze Babilon we jide ya n'arọ nke-asatọ nke ọ bu eze. 13 O si n'ebe ahu chipu àkù nile nke ulo Jehova, na àkù nile nke ulo eze, b͕upia ihe ọla-edo nile nke Solomon, bú eze Israel, mere n'ulo uku Jehova, dika Jehova siri. 14 O me-kwa-ra ka Jerusalem nile, na ndi-isi nile, na ndi-dike nile bu dìnkpà, je biri n'ala ọzọ, bú orú nnù ise ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ha na onyeọ̀kà ọ bula na uzú ọ bula; ọ dighi onye fọduru, ọ bu nání ndi nēnweghi ike nime ndi ala ahu. 15 O me-kwa-ra ka Jehoiakin je biri na Babilon; nne eze, na ndinyom eze, na ndi-onozi-ya, na ndi-dike nke ala ahu, ndia ka ọ mere ka ha si na Jerusalem je na Babilon ibu ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ. 16 Ndikom nile kwa ndi bu dìnkpà, nnù iri-na-asa na ọgu iri, na ndi-ọ̀kà na ndi-uzú, nnù abua na ọgu iri, ha nile bu ndi-dike, ndi nēbu agha, eze Babilon we me ka ha bia Babilon ibu ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ. 17 Eze Babilon we me Matanaia nwa-nne nna-ya eze n'ọnọdu ya, gughari kwa ya aha Zedekaia. 18 Zedekaia b͕ara orú arọ na otù mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ iri na otù nime Jerusalem: aha nne-ya bu Hamutal nwa Jeremaia nke Libna. 19 O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika ihe nile si di nke Jehoaiakim mere. 20 N'ihi na ọ bu n'ihi iwe Jehova ka ọ di otú a nime Jerusalem na nime Juda, rue mb͕e O siri n'iru Ya chupu ha: Zedekaia we nupu isi n'okpuru eze Babilon.

2 Ndi-Eze 25

1 O rue, n'arọ nke-iteghete nke ọ bu eze, n'ọnwa nke-iri, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu, na Nebukadneza, bú eze Babilon, biara, ya onwe-ya na usu-ndi-agha-ya nile, imegide Jerusalem, ọ ma ulo-ikwū megide ya; ha we wue ulo-agha imegide ya buruburu. 2 Ewe nānọchigide obodo ahu n'agha rue arọ nke-iri-na-otù nke eze, bú Zedekaia. 3 N'ubọchi nke-iteghete nke ọnwa nke-anọ oké unwu siri ike n'obodo ahu, ọ dighi kwa nri ndi ala ahu nwere. 4 Ewe tipue obodo, ndikom agha nile we b͕apu n'abali n'uzọ ọnu-uzọ-ama n'etiti mb͕idi-ya abua, nke di n'akuku ubi eze ab͕ara ogige: (ma ndi Kaldea nānọ imegide obodo buruburu: ) eze we je n'uzọ Araba. 5 Usu-ndi-agha ndi Kaldea we chua eze n'azu, rue ya aru n'ala ihe nādighi nke Jeriko: ma usu-ndi-agha-ya nile siri n'ebe ọ nọ b͕asasia. 6 Ha we jide eze, me ka ọ rigokuru eze Babilon rue Ribla; ha we kwue okwu ikpé n'ebe ọ nọ. 7 Ha we b͕ue umu-ndikom Zedekaia n'anya-ya, Nebukadneza me-kwa-ra ka Zedekaia kpue ìsì n'anya-ya abua, ha were kwa ihe-ọla eji ke ukwu ke ya ab͕u, ha we me ka ọ ba na Babilon. 8 Ma n'ọnwa nke-ise, n'ubọchi nke-asa nke ọnwa ahu, nke ahu bu arọ nke-iri-na-iteghete nke eze, bú Nebukadneza, eze Babilon, ka Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, orù eze Babilon, biaruru Jerusalem: 9 o sure ulo Jehova ọku, na ulo eze; ọ bu kwa ulo nile nke Jerusalem, bú ulo uku ọ bula, ka o surere n'ọku. 10 Usu-ndi-agha nile nke ndi Kaldea, ndi soro onye-isi ndi-ob͕ū, kwatu-kwa-ra mb͕idi nile nke Jerusalem buruburu. 11 Ma ndi ala ahu nke fọduru, bú ndi fọduru n'obodo, na ndi dapuru adapu, bú ndi dapuru jekuru eze Babilon, na ndi fọduru n'etiti igwè madu, ndia ka Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ha je biri n'ala ọzọ. 12 Ma ufọdu nime ndi ala ahu ndi nēnweghi ike ka onye-isi ndi-ob͕ū mere ka ha fọdu ibu ndi-ọlu-ubi-vine na ibu ndi-ọlụ-ubi. 13 Ma ogidi ọla nile nke di n'ulo Jehova, na ihe-ndọkwasi nile na oké osimiri ọla nke di n'ulo Jehova, ndia ka ndi Kaldea tipiara, chiri ọla-ha je Babilon. 14 Ite nile kwa, na osekè nile, na ihe-ikpakepu-ọku nile, na ngaji nile, na ihe ọla nile nke ha ji eje ozi, ndia ka ha chipuru. 15 Ihe-igu-ọku nile kwa, na ọkwa-nwusa nile; ihe nke bu ọla-edo, n'ọla-edo, na ihe nke bu ọla-ọcha, n'ọla-ọcha, onye-isi ndi-ob͕ū chipuru ha. 16 Ogidi abua ahu, otù oké osimiri ahu, na ihe-ndọkwasi nile, nke Solomon mere nye ulo Jehova; ọ dighi ọtùtù atùru ọla ihe ndia nile. 17 Cubit iri na asatọ ka idi-elu otù ogidi di, isi nke di n'elu ya bu kwa ọla: idi-elu isi ahu di cubit atọ; ihe-ọkpukpa na pomegranate di kwa n'isi ahu buruburu, ha nile bu ọla: ihe dika ndia ka ogidi nke-abua nwe-kwa-ra, ha na ihe-ọkpukpa. 18 Onye-isi ndi-ob͕ū we chiri Seraia, bú onye-isi-nchu-àjà, na Zefanaia, bú onye-nchu-àjà nke-abua, na ndi-nche atọ nke nbata-uzọ: 19 o si-kwa-ra n'obodo chiri otù onozi nke emeworo onye-nlekọta ndikom agha: na ndikom ise nime ndi nāhu iru eze, ndi achọtara n'obodo; na ode-akwukwọ, bú onye-isi usu-ndi-agha, onye nēme ka ndi ala ahu zukọta ibu agha; na ọgu ndikom atọ nime ndi ala ahu, ndi achọtaworo n'obodo. 20 Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, we chiri ha, me ka ha jekuru eze Babilon rue Ribla. 21 Eze Babilon we tib͕ue ha, me ka ha nwua na Ribla, n'ala Hemat. Eze we me ka Juda si n'ala-ya je biri n'ala ọzọ. 22 Ma ndi fọduru n'ala Juda, ndi Nebukadneza, bú eze Babilon, mere ka ha fọdu, o we me Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, ka ọ buru onye-nlekọta-ha. 23 Ndi-isi nile nke usu-ndi-agha nile, ha onwe-ha na ndikom-ha, we nu na eze Babilon mere Gedalaia onye-nlekọta, ha we biakute Gedalaia rue Mizpa, bú Ishmael nwa Netanaia, na Johanan nwa Karca, na Seraia nwa Tanhumet onye Netofa, na Jaazanaia nwa onye Meakat, ha onwe-ha na ndikom-ha. 24 Gedalaia we ṅuara ha iyi, ṅu-kwa-ra ndikom-ha, si ha, Unu atula egwu n'ihi ndi-orù ndi Kaldea: birinu n'ala, fè kwa eze Babilon òfùfè, ọ gādi-kwa-ra unu nma. 25 O rue, n'ọnwa nke-asa, na Ishmael nwa Netanaia, nwa Elishama, onye sitere na nkpuru ndi nwe ala-eze, biara, ya na ndikom iri, ha we tib͕ue Gedalaia, o we nwua, ha tib͕u-kwa-ra ndi-Ju na ndi Kaldea ndi ya na ha nọ na Mizpa. 26 Ndi-Ju nile, site n'onye ntà we rue onye uku, na ndi-isi usu-ndi-agha nile, we bilie, biarue Ijipt: n'ihi na ha turu egwu ndi Kaldea. 27 O rue, n'arọ nke-orú-na-iri-na-asa nke emere ka Jehoiakin, bú eze Juda, je biri n'ala ọzọ, n'ọnwa nke-iri-na-abua, n'ubọchi nke-orú-na-asa nke ọnwa ahu, na Evil-merodak, bú eze Babilon, n'arọ ọ malitere ibu eze, o siri n'ulo-nkpọrọ welie isi Jehoiakin, bú eze Juda; 28 o we gwa ya okwu ọma, do oche-eze-ya elu kari oche-eze nke ndi-eze ndi ya na ha nọ na Babilon. 29 O we b͕anwe uwe nkpọrọ ya, ọ we nēri nri n'iru ya mb͕e nile ubọchi nile nke ndu-ya. 30 Anēnye kwa ya òkè-ihe-oriri-ya, bú òkè-ihe-oriri mb͕e nile, site n'aka eze, ihe nke ubọchi n'ubọchi-ya, ubọchi nile nke ndu-ya.

1 Ihe Emere 1

1 Adam, Set, Enosh; 2 Kenan, Mahalalel, Jered; 3 Inok, Metusela, Lemek; 4 Noa, Shem, Ham, na Jefet. 5 Umu-ndikom Jefet; Goma, na Megog, na Madai, na Jevan, na Tubal, na Meshek, na Tiras. 6 Umu-ndikom Goma kwa; Ashkenaz, na Difat, na Togama. 7 Umu-ndikom Jevan kwa; Elaisha, na Tashish, na Kitim, na Rodanim. 8 Umu-ndikom Ham; Kush, na Mizraim, na Put, na Kenean. 9 Umu-ndikom Kush kwa; Seba, na Havila, na Sabta, na Reama, na Sabteka. Umu-ndikom Reama kwa; Sheba, na Dedan. 10 Kush muru Nimrod: onye ahu malitere ibu dike n'uwa. 11 Mizraim muru Ludim, na Anamim, na Lehabim, na Naftuhim, 12 na Patrusim, na Kasluhim (ebe ndi Filistia siri puta), na Kaftorim. 13 Kenean muru Zaidon, bú ọkpara-ya, na Het; 14 na ndi Jebus, na ndi-Amorait, na ndi-Giagashait; 15 na ndi-Haivait, na ndi Aka, na ndi Sin; 16 na ndi Avad, na ndi Zema, na ndi Hemat. 17 Umu-ndikom Shem; Ilam, na Ashua, na Apakshad, na Lud, na Eram, na Uz, na Hul, na Geta, na Meshek. 18 Apakshad muru Shela; Shela muru Iba. 19 Amuru umu-ndikom abua nye Iba; aha otù nime ha bu Peleg; n'ihi na ọ bu n'ubọchi-ya ka ekewara uwa; aha nwa-nne-ya nwoke bu Jọktan. 20 Jọktan muru Almodad, na Shelef, na Hazamavet, na Jera; 21 na Hadoram, na Uzal, na Dikla; 22 na Ibal, na Abimael, na Sheba; 23 na Ofia, na Havila, na Jobab. Ndia nile bu umu-ndikom Jọktan. 24 Shem, Apakshad, Shela; 25 Iba, Peleg, Reu; 26 Serug, Nehoa, Tira; 27 Abram, (nke ahu bu Abraham). 28 Umu-ndikom Abraham; Aisak, na Ishmael. 29 Ndia bu osuso-ọmumu nile ha: ọkpara Ishmael, Nebaiot; na Kida, na Adbeel, na Mibsam, 30 na Mishma, na Duma, na Masa; na Hedad, na Tima, 31 na Jetua, na Nafish, na Kidema. Ndia bu umu-ndikom Ishmael. 32 Umu-ndikom Ketura kwa, bú nwayi-iko Abraham: ọ muru Zimran, na Jọkshan, na Medan, na Midian, na Ishbak, na Shua. Umu-ndikom Jọkshan kwa; Sheba, na Dedan. 33 Umu-ndikom Midian; Ifa, na Ifea, na Hanok, na Abida, na Eldea. Ndia nile bu umu Ketura. 34 Abraham muru Aisak. Umu-ndikom Aisak; Isọ, na Israel. 35 Umu-ndikom Isọ; Elifaz, na Reuel, na Jeush, na Jalam, na Kora. 36 Umu-ndikom Elifaz; Timan, na Oma, na Zefi, na Gatam, na Kenaz, na Timna, na Amalek. 37 Umu-ndikom Reuel; Nahat, na Zera, na Shama, na Miza. 38 Umu-ndikom Sia kwa; Lotan, na Shobal, na Zibeon, na Ana, na Dishon, na Iza, na Dishan. 39 Umu-ndikom Lotan kwa; Hori, na Homam: nwa-nne-nwayi Lotan bu kwa Timna. 40 Umu-ndikom Shobal; Alian, na Manahat, na Ibal, na Shefi, na Onam. Umu-ndikom Zibeon kwa; Aja, na Ana. 41 Umu-ndikom Ana; Dishon. Umu-ndikom Dishon kwa; Hamran, na Eshban, na Itran, na Keran. 42 Umu-ndikom Iza; Bilhan, na Zaavan, na Jaakan. Umu-ndikom Dishan; Uz, na Aran. 43 Ndia bu eze ndi bu eze n'ala Edom, tutu eze ọ bula bu eze umu Israel: Bela nwa Beoa; aha obodo-ya bu Dinhaba. 44 Bela we nwua, Jobab nwa Zera, nke sitere na Bọzra, we buru eze n'ọnọdu ya. 45 Jobab we nwua, Husham, nke sitere n'ala ndi Timan, we buru eze n'ọnọdu ya. 46 Husham we nwua, Hedad nwa Badad, onye tib͕uru Midian n'ọhia Moab, we buru eze n'ọnọdu ya: aha obodo-ya bu Avit. 47 Hedad we nwua, Samla, nke sitere na Masrika, we buru eze n'ọnọdu ya. 48 Samla we nwua, Shaul, nke sitere na Rehobot n'usọ Osimiri, we buru eze n'ọnọdu ya. 49 Shaul we nwua, Beal-hanan nwa Akboa we buru eze n'ọnọdu ya. 50 Beal-hanan we nwua, Hedad we buru eze n'ọnọdu-ya; aha obodo-ya bu Pai: aha nwunye-ya bu Mehetabel nwa Matred, bú nwa-nwayi Me-zahab. 51 Hedad we nwua. Ndi-isi Edom bu kwa; Timna onye-isi, Alia onye-isi, Jetet onye-isi; 52 Ọhọlibama onye-isi, Ila onye-isi, Pinon onye-isi; 53 Kenaz onye-isi, Timan onye-isi, Mibza onye-isi; 54 Magdiel onye-isi, Iram onye-isi. Ndia bu ndi-isi Edom.

1 Ihe Emere 2

1 Ndia bu umu-ndikom Israel; Reuben, Simeon, Livai, na Juda, Isaka na Zebulun; 2 Dan, Josef na Benjamin, Naftali, Gad na Asha. 3 Umu-ndikom Juda kwa; Ia, na Onan, na Shila: umu atọ ndia ka Bat-shua, bú nwayi Kenean, muru nye ya. Ma Ia, bú ọkpara Juda, jọrọ njọ n'anya Jehova; O we me ka ọ nwua. 4 Tema, bú nwunye nwa-ya, we muara ya Perez na Zera. Umu-ndikom nile nke Juda di ise. 5 Umu-ndikom Perez; Hezron na Hamul. 6 Umu-ndikom Zera kwa; Zimri, na Itan, na Himan, na Kalkol, na Dara: ha nile di ise. 7 Umu-ndikom Kami kwa; Eka, bú onye nēmekpa Israel aru, onye mekpuru ihe-nmekpu n'ihe ewezugara nye Jehova. 8 Umu-ndikom Itan kwa; Azaraia. 9 Umu-ndikom Hezron kwa, ndi amuru nye ya; Jerahmeel, na Ram, na Kelubai. 10 Ram we mua Aminadab; Aminadab mua Nahshon, bú onye-isi umu Juda: 11 Nahshon mua Salma, Salma mua Boaz; 12 Boaz mua Obed, Obed mua Jesi; 13 Jesi mua ọkpara-ya, bú Elaiab, na Abinadab, bú nke-abua, na Shimea, bú nke-atọ; 14 na Netanel, bú nke-anọ, na Radai, bú nke-ise; 15 na Ozem, bú nke-isi, na Devid, bú nke-asa: 16 Umu-nne-ha ndinyom bu Zeruaia na Abigail. Umu-ndikom Zeruaia kwa; Abishai, na Joab, na Asahel, atọ. 17 Abigail mu-kwa-ra Amasa: ma nna Amasa bu Jeta onye Ishmael. 18 Keleb nwa Hezron muru umu site n'Azuba, bú nwunye-ya, site kwa na Jeriot: ndia bu umu-ndikom nwayi ahu; Jesha, na Shobab, na Adon. 19 Azuba we nwua, Keleb we lutara onwe-ya Efrat, o we muara ya Hua. 20 Hua mua Uri, Uri mua Bezalel. 21 Emesia Hezron bakuru nwa-nwayi Makia, bú nna Gilead; ma nwoke ahu lutara ya mb͕e ya onwe-ya b͕ara ọgu arọ atọ; o we muara ya Segub. 22 Segub we mua Jaia, nke nwere orú obodo na atọ n'ala Gilead. 23 Geshua na Eram we nara ha Havot-jaia, ha na Kenat, na umu-obodo-ya, bú ọgu obodo atọ. Ndia nile bu umu-ndikom Makia nna Gilead. 24 Ma mb͕e Hezron nwusiri nime Keleb-efrata, mb͕e ahu nwunye Hezron, bú Abia, we muara ya Ashua nna Tekoa. 25 Umu-ndikom Jerahmeel ọkpara Hezron bu kwa: Ram, bú ọkpara, na Buna, na Oren, na Ozem, na Ahaija. 26 Ma Jerahmeel nwere nwunye ọzọ, aha-ya bu Atara; nwayi ahu bu nne Onam. 27 Umu-ndikom Ram, bú ọkpara Jerahmeel, bu Maaz, na Jamin, na Eka. 28 Umu-ndikom Onam bu Shamai, na Jada: umu-ndikom Shamai kwa; Nedab, na Abishua. 29 Aha nwunye Abishua bu Abihail; o we muara ya Ahban, na Molid. 30 Umu-ndikom Nedab kwa; Seled, na Apaim: Seled we nwua nēnweghi umu-ndikom. 31 Umu-ndikom Apaim kwa; Ishi. Umu-ndikom Ishi kwa; Sheshan. Umu-ndikom Sheshan kwa; Ahlai. 32 Umu-ndikom Jada kwa, bú nwa-nne Shamai; Jeta, na Jonatan: Jeta we nwua nēnweghi umu-ndikom. 33 Umu-ndikom Jonatan kwa; Pelet, na Zaza. Ndia bu umu-ndikom Jerahmeel. 34 Ma Sheshan enweghi umu-ndikom, nání umu-ndinyom ka o nwere. Sheshan nwe-kwa-ra orù, bú onye Ijipt, aha-ya bu Jaha. 35 Sheshan we were nwa-ya nwayi nye Jaha, bú orù-ya, na nwunye; o we muara ya Atai. 36 Atai mua Netan, Netan mua Zabad; 37 Zabad mua Eflal, Eflal mua Obed; 38 Obed mua Jihu, Jihu mua Azaraia; 39 Azaraia mua Helez, Helez mua Eleasa; 40 Eleasa mua Sismai, Sismai mua Shalum; 41 Shalum mua Jekamaia, Jekamaia mua Elishama. 42 Umu-ndikom Keleb kwa, bú nwa-nne Jerahmeel; Misha, bú ọkpara-ya, onye ahu bu nna Zif; na umu-ndikom Marisha, bú nna Hebron. 43 Umu-ndikom Hebron kwa; Kora, na Tapua, na Rekem, na Shema. 44 Shema we mua Raham, bú nna Jọkeam; Rekem mu-kwa-ra Shamai. 45 Nwa-nwoke Shamai bu Maon; Maon bu nna Bet-zua. 46 Ifa, bú iko-nwayi Keleb, muru Haran, na Moza, na Gazez: Haran we mua Gazez. 47 Umu-ndikom Jahdai kwa; Regem, na Jotam, na Gishan, na Pelet, na Ifa, na Shaaf. 48 Iko-nwayi Keleb, bú Meaka, muru Sheba na Tiahana. 49 Ọ mu-kwa-ra Shaaf nna Madmana, na Sheva nna Makbina, na nna Gibea; nwa-nwayi Keleb bu Aksa. 50 Ndia bu umu-ndikom Keleb; nwa-nwoke Hua, ọkpara Efrata, Shobal nna Kiriat-jearim; 51 Salma nna Bet-lehem, Harif nna Bet-gadea. 52 Shobal nna Kiriat-jearim nwe-kwa-ra umu-ndikom; Haroe, nkera Menuhot. 53 Ab͕uru nile nke Kiriat-jearim kwa; ndi-Jeta, na ndi-Putait, na ndi-Shumatait, na ndi-Mishraait; nime ndia ka ndi Zọra na ndi Eshtaol si puta. 54 Umu-ndikom Salma; Bet-lehem, na ndi Netofa, Atrot-bet-Joab, na nkera ndi Mahanat, ndi Zọra. 55 Ab͕uru nile kwa nke ndi-ode-akwukwọ ndi bi na Jebez; ndi-Tiratait, ndi-Shimeatait, ndi-Sukatait. Ndia bu ndi-Kinait, ndi nēsite na Hamat, bú nna ulo Rikab.

1 Ihe Emere 3

1 Ma ndia bu umu-ndikom Devid, ndi amuru nye ya nime Hebron: ọkpara-ya, bú Amnon, nwa Ahinoam nwayi Jezreel; nke-abua, Daniel, nwa Abigail nwayi Kamel; 2 nke-atọ, Absalom nwa Meaka nwa-nwayi Talmai, bú eze Geshua; nke-anọ, Adonaija nwa Hagit; 3 nke-ise, Shefataia nwa Abital; nke-isi, Itream nwa Egla, bú nwunye-ya. 4 Umu isi ka amuru nye ya nime Hebron; o we buru eze n'ebe ahu arọ asa na ọnwa isi: orú arọ na iri na atọ ka ọ bu eze na Jerusalem. 5 Ma ndia ka amuru nye ya nime Jerusalem: Shimea, na Shobab, na Netan, na Solomon, anọ, bú nke Bat-shua nwa-nwayi Amiel: 6 na Ibha, na Elishama, na Elifelet; 7 na Noga, na Nefeg, na Jafia; 8 na Elishama, na Eliada, na Elifelet, iteghete. 9 Ndia nile bu umu-ndikom Devid, nāgughi umu-ndikom ndi-iko-ya ndinyom; Tema bu nwa-nne-ha nwayi. 10 Nwa Solomon bu Rehoboam, Abaija nwa-ya, Esa nwa-ya, Jehoshafat nwa-ya; 11 Joram nwa-ya, Ehazaia nwa-ya, Joash nwa-ya; 12 Amazaia nwa-ya, Azaraia nwa-ya, Jotam nwa-ya; 13 Ehaz nwa-ya, Hezekaia nwa-ya, Manase nwa-ya; 14 Emon nwa-ya, Josaia nwa-ya. 15 Umu-ndikom Josaia kwa; ọkpara-ya Johanan, nke-abua Jehoiakim, nke-atọ Zedekaia, nke-anọ Shalum. 16 Umu-ndikom Jehoiakim kwa: Jekonaia nwa-ya, Zedekaia nwa-ya. 17 Umu-ndikom Jekonaia kwa, bú onye-nkpọrọ: Shealtiel nwa-ya, 18 na Malkiram, na Pedaia, na Shenaza, na Jekamaia, na Hoshama, na Nedabaia. 19 Umu-ndikom Pedaia kwa; Zerubabel, na Shimai: umu-ndikom Zerubabel kwa; Meshulam, na Hananaia; Shelomit bu nwa-nne-ha nwayi: 20 na Hashuba, na Ohel, na Berekaia, na Hasadaia, na Jushab-hesed, ise. 21 Umu-ndikom Hananaia kwa; Pelataia, na Jeshaia: umu-ndikom Refaia, umu-ndikom Anan, umu-ndikom Obadaia, umu-ndikom Shekanaia. 22 Umu-ndikom Shekanaia kwa; Shemaia: umu-ndikom Shemaia kwa: Hatush, na Igal, na Baria, na Nearaia, na Shefat, isi. 23 Umu-ndikom Nearaia kwa; Elioenai, na Hizkia, na Azrikam, atọ. 24 Umu-ndikom Elioenai kwa; Hodavaia, na Elaiashib, na Pelaia, na Akub, na Johanan, na Delaia, na Anani, asa.

1 Ihe Emere 4

1 Umu-ndikom Juda; Perez, na Hezron, na Kami, na Hua, na Shobal. 2 Reaia nwa-nwoke Shobal we mua Jahat; Jahat we mua Ahumai na Lahad. Ndia bu ab͕uru ndi Zọra. 3 Ndia bu kwa umu-ndikom nna Etam; Jezreel, na Ishma, na Idbash: aha nwa-nne-ha nwayi bu Hazelelponi: 4 na Penuel nna Gedoa, na Iza nna Husha. Ndia bu umu-ndikom Hua, bú ọkpara Efrata, nna Bet-lehem. 5 Ma Ashua nna Tekoa nwere ndinyom abua, bú Hela na Naara. 6 Naara we muara ya Ahuzam, na Hifa, na Timeni, na Haahashtari. Ndia bu umu-ndikom Naara. 7 Umu-ndikom Hela bu kwa Zeret, na Zoha, na Etnan. 8 Koz we mua Anub, na Zobiba, na ab͕uru nile nke Ahahel nwa Harum. 9 Ma asọpuru Jebez kari umu-nne-ya ndikom: ma nne-ya kpọrọ aha-ya Jebez, si, N'ihi na amurum ya n'ihe-nb͕u. 10 Jebez we kpọkue Chineke Israel, si, Ọ gādim nọ̄ nma ma ọ buru na I gọziem n'ezie, me kwa ka ókè-alam rie nne, ọ buru kwa na aka-Gi gādiyerem, I we me ka m'pua n'ihe ọjọ, ka ọ ghara iwutam! Chineke we me ka ihe nke ọ riọrọ biarue ya aru. 11 Kelub nwa-nne Shua we mua Mehia, onye ahu bu nna Eshton. 12 Eshton we mua Bet-rafa, na Pasea, na Tehina, bú nna Ia-nehash. Ndia bu ndikom Rika. 13 Umu-ndikom Kenaz kwa; Ọtniel, na Seraia: umu-ndikom Ọtniel kwa; Hatat. 14 Meonotai we mua Ọfra: Seraia mu-kwa-ra Joab, bú nna Gi-harashim: n'ihi na ndi-ọ̀kà ka ha bu. 15 Umu-ndikom Keleb nwa Jefune kwa; Iru, na Ila, na Naam: umu-ndikom Ila kwa; na Kenaz. 16 Umu-ndikom Jehalelel kwa; Zif, na Zifa, na Tiria, na Asarel. 17 Umu-ndikom Ezra kwa; Jeta, na Mered, na Ifa, na Jalon: o we mua Miriam, na Shamai, na Ishba, bú nna Eshtemoa. 18 Nwunye-ya, bú Hajehudija, we mua Jered nna Gedoa, na Heba nna Soko, na Jekutiel nna Zanoa. Ndia bu kwa umu-ndikom Bitia, bú nwa-nwayi Fero, nke Mered luru na nwunye. 19 Umu-ndikom nwunye Hodia, nwa-nne-nwayi Naham, bu nna Keila onye-Gamait, na Eshtemoa onye Meakat. 20 Umu-ndikom Shimon kwa; Amnon, na Rina, na Ben-hanan, na Tilon. Umu-ndikom Ishi kwa; Zohet, na Ben-zohet. 21 Umu-ndikom Shila nwa Juda; Ia nna Lika, na Laada nna Marisha, na ab͕uru nile nke ulo ndi nākpa ezi ákwà ọcha, nke ulo Ashbia; 22 na Jokim, na ndikom Koziba, na Joash, na Saraf, bú ndi-nwe Moab, na Jashubi-lehem. Ma ihe ndia bu ihe ochie. 23 Ndi ahu bu ndi-ọkpu-ite, na ndi bi na Netaim na Gedira; ọ bu n'aka eze n'ije-ozi-ya ka ha biri n'ebe ahu. 24 Umu-ndikom Simeon; Nemuel, na Jamin, na Jarib, na Zera, na Shaul: 25 Shalum nwa-ya, Mibsam nwa-ya, Mishma nwa-ya. 26 Umu-ndikom Mishma kwa; Hamuel nwa-ya, Zakua nwa-ya, Shimai nwa-ya. 27 Shimai nwe-kwa-ra umu-ndikom iri na isi, na umu-ndinyom isi; ma umu-nne-ya ndikom enweghi ọtutu umu-ndikom, ab͕uru-ha nile abaghi kwa uba, ra ka umu Juda. 28 Ha we biri na Bia-sheba, na Molada, na Haza-shual; 29 na nime Bilha, na n'Ezem, na nime Tolad; 30 na nime Betuel, na nime Họma, na nime Ziklag; 31 na nime Bet-makabot, na nime Haza-susim, na nime Bet-biri, na nime Shaaraim. Ndia bu obodo-ha rue mb͕e Devid bu eze. 32 Obodo ntà ha bu Itam, na Ain, na Rimon, na Token, na Ashan, obodo ise: 33 na obodo ntà ha nile nke di obodo ahu buruburu, rue Beal. Ndia bu ebe-obibi-ha, ha nwe-kwa-ra akwukwọ-osuso-ọmumu-ha. 34 Na Meshobab, na Jamlek, na Josha nwa Amazaia; 35 na Joel, na Jihu nwa Joshibia, nwa Seraia, nwa Asiel; 36 na Elioenai, na Jaakoba, na Jeshohaia, na Asaia, na Adiel, na Jesimiel, na Benaia; 37 na Ziza nwa Shifi, nwa Alon, nwa Jedaia, nwa Shimri, nwa Shemaia; 38 Ndia ndi baworo n'akwukwọ n'aha bu ndi-isi n'ab͕uru-ha: ulo nke ndi bu nna-ha we basa rue ọtutu. 39 Ha we jerue nbata Gedoa, rue n'akuku ọwuwa-anyanwu ndagwurugwu, ichọ ihe iji zù ìgwè ewu na aturu-ha. 40 Ha we chọta ihe-ọzùzù mara abuba di kwa nma, ala ahu sa-kwa-ra mbara n'akuku-ya abua, nādi kwa jū, nwe kwa udo; n'ihi na ndi bi n'ebe ahu na mb͕e gara aga sitere na Ham. 41 Ndia ndi edeworo n'akwukwọ n'aha we bia n'ubọchi Hezekaia, bú eze Juda, tib͕ue ọmuma-ulo-ikwū-ha, na Meunim ndi ahuru n'ebe ahu, ha we wezuga ha ka ebibie ha, rue ta, we biri n'ọnọdu ha: n'ihi na ihe eji zù ìgwè ewu na aturu-ha di n'ebe ahu. 42 Ufọdu nime ha, bú ufọdu nime umu Simeon, nnù ndikom na ọgu ise, je-kwa-ra ugwu Sia; Pelataia, na Nearaia, na Refaia, na Uziel, bú umu Ishi, bu ndi-isi-ha. 43 Ha we tib͕ue ndi fọduru n'etiti ndi Amalek b͕apuru ab͕apu, ha we biri n'ebe ahu, rue ta.

1 Ihe Emere 5

1 Ma umu-ndikom Reuben ọkpara Israel, (n'ihi na onye ahu bu ọkpara; ma, n'ihi na o mere ute nna-ya ka ọ ghara idi nsọ, enyere umu Josef nwa Israel ọnọdu-ọkpara-ya; agaghi-ede kwa ya n'akwukwọ-osuso-ọmumu dika ọnọdu-ọkpara si di. 2 N'ihi na Juda di ike n'etiti umu-nne-ya, onye-ndú we si nime ya puta; ma Josef nwere ọnọdu-ọkpara: ) 3 umu-ndikom Reuben ọkpara Israel; Hanok, na Palu, na Hezron, na Kami. 4 Umu-ndikom Joel; Shemaia nwa-ya, Gog nwa-ya, Shimai nwa-ya; 5 Maika nwa-ya, Reaia nwa-ya, Beal nwa-ya; 6 Beera nwa-ya, onye Tilgat-pilnesa, bú eze Asiria, mere ka ọ je biri n'ala ọzọ: onye ahu bu onye-isi ndi Reuben nwere. 7 Na umu-nne-ya ndikom dika ab͕uru nile ha si di, mb͕e edere akwukwọ-osuso-ọmumu nke osuso-ọmumu nile ha; onye-isi, bú Jeiel, na Zekaraia, 8 na Bela nwa Azaz, nwa Shema, nwa Joel, onye ahu bi n'Aroea, we rue Nebo na Beal-meon: 9 ma n'ọwuwa-anyanwu o biruru nbata ọzara, bú site n'osimiri Yufretis: n'ihi na anu-ulo-ha bara uba n'ala Gilead. 10 Ma n'ubọchi Sọl ha busoro ndi Haga agha, ndi dara n'aka-ha: ha we biri n'ulo-ikwū-ha n'elu ala nile nke ọwuwa-anyanwu Gilead. 11 Umu Gad biri kwa na ncherita-iru ha, n'ala Beshan rue Saleka: 12 Joel, bú onye-isi, na Shafam, bú nke-abua, na Janai, na Shefat nime Beshan: 13 na umu-nne-ha ndikom nke ulo nke ndi bu nna-ha; Maikael, na Meshulam, na Sheba, na Jorai, na Jakan, na Zia, na Iba, asa. 14 Ndia bu umu-ndikom Abihail nwa Huri, nwa Jaroa, nwa Gilead, nwa Maikael, nwa Jeshishai, nwa Jahdo, nwa Buz; 15 Ahi nwa Abdiel, nwa Guni, bú onye-isi ulo nke ndi bu nna-ha. 16 Ha we biri na Gilead nime Beshan, na n'ime-obodo-ya, na n'ebe-ita-nri nile nke Sheron, rue ọpupu nile ha. 17 Edere ha nile n'akwukwọ-osuso-ọmumu n'ubọchi Jotam, bú eze Juda, na n'ubọchi Jeroboam, bú eze Israel. 18 Umu Reuben, na ndi Gad, na nkera ebo Manase, nime ndi bu dìnkpà, ndikom nēbu ọta na mma-agha, nāzọgide kwa uta ikwe ya, ndi ezíwo-kwa-ra ibu agha, di orú nnù ndikom uzọ ise na nnù iri-na-otù na ọgu iri-na-asatọ, ndi nāpukuru usu-ndi-agha. 19 Ha we buso ndi Haga, na Jetua, na Nafish, na Nodab, agha. 20 Ewe yere ha aka imegide ha, ewe nye ndi Haga na ndi nile ha na ha yikọrọ n'aka-ha: n'ihi na ọ bu Chineke ka ha kpọkuru n'agha ahu, O we kwe ka ha riọta ihe ha riọrọ; n'ihi na ha tukwasiri Ya obi. 21 Ha we chiri anu-ulo-ha n'agha: camel-ha orú nnù uzọ isi na nnù ise, na ìgwè ewu na aturu orú nnù orú uzọ na uzọ iri-na-otù na nnù ise, na inyinya-ibu nnù ise, na madu orú nnù uzọ iri-na-abua na nnù iri. 22 N'ihi na ọtutu ndi eb͕uru eb͕u dara, n'ihi na agha ahu sitere na Chineke. Ha we biri n'ọnọdu ha rue mb͕e emere ka ha je biri n'ala ọzọ. 23 Umu nkera ebo Manase biri kwa n'ala ahu: site na Beshan rue Beal-heamon na Senia na ugwu Heamon ka ndi ahu bara uba. 24 Ma ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha, bú Ifa, na Ishi, na Eliel, na Azriel, na Jeremaia, na Hodavaia, na Jahdiel, ndi-dike bu dìnkpà, ndikom amara aha-ha, ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha. 25 Ha we mekpue emekpu megide Chineke nke ndi bu nna-ha, soro chi nile nke ndi ala ahu kwa iko, bú ndi Chineke kpochapuru n'iru ha. 26 Chineke Israel we kpọte mọ Pul, bú eze Asiria, na mọ Tilgat-pilnesa, bú eze Asiria, o we me ka ha je biri n'ala ọzọ, bú ndi Reuben, na ndi Gad, na nkera ebo Manase, o we me ka ha biarue Hala, na Haboa, na Hara, na osimiri Gozan, rue ta.

1 Ihe Emere 6

1 Umu-ndikom Livai; Giashon, na Kohat, na Merari. 2 Umu-ndikom Kohat kwa; Amram, na Izha, na Hebron, na Uziel. 3 Umu Amram kwa; Eron, na Moses, na Miriam. Umu-ndikom Eron kwa; Nedab, na Abaihu, na Eleeza, na Itama. 4 Eleeza muru Finehas, Finehas muru Abishua; 5 Abishua we mua Buki, Buki mua Uzi; 6 Uzi mua Zerahia, Zerahia mua Meraiot; 7 Meraiot mua Amaraia, Amaraia mua Ahaitub; 8 Ahaitub mua Zedok, Zedok mua Ahimaaz; 9 Ahimaaz mua Azaraia, Azaraia mua Johanan; 10 Johanan mua Azaraia, (ọ bu onye ahu bu onye-nchu-àjà n'ulo Solomon wuru nime Jerusalem: ) 11 Azaraia mua Amaraia, Amaraia mua Ahaitub; 12 Ahaitub mua Zedok, Zedok mua Shalum; 13 Shalum mua Hilkaia, Hilkaia mua Azaraia; 14 Azaraia mua Seraia, Seraia mua Jehozadak; 15 Jehozadak we je mb͕e Jehova mere ka Juda na Jerusalem je biri n'ala ọzọ n'aka Nebukadneza. 16 Umu-ndikom Livai; Giashom, na Kohat, na Merari. 17 Ma ndia bu aha umu-ndikom Giashom; Libni, na Shimai. 18 Umu-ndikom Kohat bu Amram, na Izha, na Hebron, na Uziel. 19 Umu-ndikom Merari; Mahli na Mushi. Ndia bu ab͕uru Livai dika ulo nke ndi bu nna-ha si di. 20 Nke Giashom; Libni nwa-ya, Jahat nwa-ya, Zima nwa-ya; 21 Joa nwa-ya, Ido nwa-ya, Zera nwa-ya, Jeaterai nwa-ya. 22 Umu-ndikom Kohat; Aminadab nwa-ya, Kora nwa-ya, Asia nwa-ya; 23 Elkena nwa-ya, Ebiasaf nwa-ya, na Asia nwa-ya; 24 Tahat nwa-ya, Uriel nwa-ya, Uzaia nwa-ya, na Shaul nwa-ya. 25 Umu-ndikom Elkena kwa; Amasai, na Ahimot. 26 Ma Elkena: umu-ndikom Elkena; Zofai nwa-ya, na Nehat nwa-ya; 27 Elaiab nwa-ya, Jeroham nwa-ya, Elkena nwa-ya. 28 Umu-ndikom Samuel kwa; ọkpara-ya, bú Joel, na nke-abua, bú Abaia. 29 Umu-ndikom Merari; Mahli, Libni nwa-ya, Shimai nwa-ya, Uza nwa-ya; 30 Shimea nwa-ya, Hagia nwa-ya, Asaia nwa-ya. 31 Ndia bu kwa ndi Devid guzoro dika ndi-isi akuku abua nke ndi-ọbù-abù nke ulo Jehova, site na mb͕e ib͕e Chineke zuru ike. 32 Ha we nēje ozi n'iru ebe-obibi ulo-ikwū nzute n'abù, rue mb͕e Solomon wuru ulo Jehova nime Jerusalem: ha we guzo n'ibu ndi-isi òfùfè-ha dika ikpe ekpere ha si di. 33 Ndia bu kwa ndi nēguzo, ha na umu-ha ndikom. Nime umu-ndikom ndi Kohat: Himan ọbù-abù, nwa Joel, nwa Samuel; 34 nwa Elkena, nwa Jeroham, nwa Eliel, nwa Toa; 35 nwa Zuf, nwa Elkena, nwa Mahat, nwa Amasai; 36 nwa Elkena, nwa Joel, nwa Azaraia, nwa Zefanaia; 37 nwa Tahat, nwa Asia, nwa Ebiasaf, nwa Kora; 38 nwa Izha, nwa Kohat, nwa Livai, nwa Israel. 39 Na nwa-nne-ya nwoke, bú Esaf, onye nēguzo n'aka-nri-ya, bú Esaf nwa Berekaia, nwa Shimea; 40 nwa Maikael, nwa Baaseia, nwa Malkija; 41 nwa Etni, nwa Zera, nwa Adaia; 42 nwa Itan, nwa Zima, nwa Shimai; 43 nwa Jahat, nwa Giashom, nwa Livai. 44 Umu-ndikom Merari, bú umu-nne-ha, nọ kwa n'aka-ekpe: Itan nwa Kishi, nwa Abdi, nwa Maluk; 45 nwa Hashabaia, nwa Amazaia, nwa Hilkaia; 46 nwa Amzi, nwa Bani, nwa Shemea; 47 nwa Mahli, nwa Mushi, nwa Merari, nwa Livai. 48 Enye-kwa-ra umu-nne-ha, bú ndi Livai, ifè òfùfè nile nke ebe-obibi ulo Chineke. 49 Ma Eron na umu-ya ndikom nēsure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku, na n'elu ebe-ichu-aja nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, bayere ije-ozi nile nke ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile, na ikpuchiri Israel nmehie-ha, dika ihe nile si di nke Moses, bú orù Chineke, nyere n'iwu. 50 Ndia bu kwa umu-ndikom Eron; Eleeza nwa-ya, Finehas nwa-ya, Abishua nwa-ya; 51 Buki nwa-ya, Uzi nwa-ya, Zerahaia nwa-ya; 52 Meraiot nwa-ya, Amaraia nwa-ya, Ahaitub nwa-ya; 53 Zedok nwa-ya, Ahimaaz nwa-ya. 54 Ma ndia bu ebe-obibi-ha dika ebe-ulo-ikwū nile ha si di n'ókè-ala nile ha: enyere umu Eron, bú ab͕uru ndi Kohat, n'ihi na ha nwere ife-nzà mbu, 55 ha we nye ha Hebron n'ala Juda, na ebe-ita-nri-ya nile buruburu ya; 56 ma ha nyere Keleb nwa Jefune ọhia obodo ahu, na obodo ntà ya nile. 57 Umu Eron ka ha nye-kwa-ra obodo nb͕aba, Hebron; na Libna na ebe-ita-nri-ya nile, na Jatia, na Eshtemoa na ebe-ita-nri-ya nile; 58 na Hilen na ebe-ita-nri-ya nile, na Debia na ebe-ita-nri-ya nile; 59 na Ashan na ebe-ita-nri-ya nile, na Bet-shemesh na ebe-ita-nri-ya nile: 60 site kwa n'ebo Benjamin; Geba na ebe-ita-nri-ya nile, na Alemet na ebe-ita-nri-ya nile, na Anatot na ebe-ita-nri-ya nile. Obodo-ha nile bu obodo iri na atọ n'ab͕uru-ha nile. 61 Enye-kwa-ra umu Kohat, bú ndi fọduru, nime ab͕uru ebo ahu, nime nkera ebo ahu, bú nkera ebo Manase, obodo iri n'ife-nzà. 62 Enye-kwa-ra umu Giashom, dika ab͕uru nile ha si di, site n'ebo Isaka, site kwa n'ebo Asha, site kwa n'ebo Naftali, site kwa n'ebo Manase nime Beshan, obodo iri na atọ. 63 Enyere umu Merari, dika ab͕uru nile ha si di, site n'ebo Reuben, site kwa n'ebo Gad, site kwa n'ebo Zebulun, obodo iri na abua n'ife-nzà. 64 Umu Israel we nye ndi Livai obodo ndia na ebe-ita-nri-ha. 65 Ha we nye obodo ndia, nke ha kpọrọ aha, site n'ebo umu Juda, site kwa n'ebo umu Simeon, site kwa n'ebo umu Benjamin, n'ife-nzà. 66 Ma ufọdu nime ab͕uru umu Kohat nwere obodo ókè-ala nile ha site n'ebo Efraim. 67 Ha nyere ha obodo nb͕abà, bú Shekem na ebe-ita-nri-ya nile n'ugwu Efraim; Gezea kwa na ebe-ita-nri-ya nile; 68 na Jọkmeam na ebe-ita-nri-ya nile, na Bet-horon na ebe-ita-nri-ya nile; 69 na Ajalon na ebe-ita-nri-ya nile, na Gat-rimon na ebe-ita-nri-ya nile: 70 site kwa na nkera ebo Manase; Anea na ebe-ita-nri-ya nile, na Bileam na ebe-ita-nri-ya nile ka enyere umu Kohat fọduru. 71 Enyere umu Giashom, site n'ab͕uru nkera ebo Manase, Golan nime Beshan na ebe-ita-nri-ya nile, na Ashtarot na ebe-ita-nri-ya nile: 72 site kwa n'ebo Isaka; Kedesh na ebe-ita-nri-ya nile, na Daberat na ebe-ita-nri-ya nile; 73 na Remot na ebe-ita-nri-ya nile, na Anem na ebe-ita-nri-ya nile: 74 site kwa n'ebo Asha; Mashal na ebe-ita-nri-ya nile, na Abdon na ebe-ita-nri-ya nile; 75 na Hukok na ebe-ita-nri-ya nile, na Rehob na ebe-ita-nri-ya nile: 76 site kwa n'ebo Naftali; Kedesh nime Galili na ebe-ita-nri-ya nile, na Hamon na ebe-ita-nri-ya nile, na Kiriataim na ebe-ita-nri-ya nile. 77 Enyere umu Merari, bú ndi fọduru nime ndi Livai, site n'ebo Zebulun, Rimono na ebe-ita-nri-ya nile, na Teboa na ebe-ita-nri-ya nile: 78 enye-kwa-ra ha n'ofè Jọdan n'akuku Jeriko, n'akuku ọwuwa-anyanwu Jọdan, site n'ebo Reuben, Beza n'ọzara na ebe-ita-nri-ya nile, na Jahza na ebe-ita-nri-ya nile, 79 na Kedimot na ebe-ita-nri-ya nile, na Mefaat na ebe-ita-nri-ya nile: 80 site kwa n'ebo Gad; Remot nime Gilead na ebe-ita-nri-ya nile, na Mahanaim na ebe-ita-nri-ya nile, 81 na Heshbon na ebe-ita-nri-ya nile, na Jeza na ebe-ita-nri-ya nile.

1 Ihe Emere 7

1 Ma umu-ndikom Isaka; Tola, na Pua, na Jashub, na Shimron, anọ. 2 Umu-ndikom Tola kwa; Uzi, na Refaia, na Jeriel, na Jahmai, na Ibsam, na Shemuel, ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha, bú ndi nke Tola; ha bu ndi-dike bu dìnkpà n'osuso-ọmumu nile ha: ọnu-ọgugu-ha n'ubọchi Devid di orú nnù uzọ abua na nnù iri-na-isi na ọgu iri. 3 Umu-ndikom Uzi kwa; Izrahia: umu-ndikom Izrahia kwa; Maikael, na Obadaia, na Joel, na Ishia, ise: ndi-isi ka ha nile bu. 4 Usu ndi nāpunara madu ihe nke usu-ndi-agha so-kwa-ra ha, n'osuso-ọmumu-ha, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, ha di orú nnù uzọ anọ na nnù iri: n'ihi na ha nwere ọtutu ndinyom na umu-ndikom. 5 Umu-nne-ha kwa nke ab͕uru nile nke Isaka, ndi-dike bu dìnkpà, di orú nnù uzọ iri na nnù iri-na-asa na ọgu iri, edewo ha nile n'akwukwọ-osuso-ọmumu. 6 Umu-ndikom Benjamin; Bela, na Bekea, na Jediael, atọ. 7 Umu-ndikom Bela kwa; Ezbon, na Uzi, na Uziel, na Jerimot, na Iri, ise; ndi-isi ulo nke ndi bu nna, ndi-dike bu dìkpà; edewo kwa ha n'akwukwọ-osuso-ọmumu, ha di orú nnù uzọ abua na nnù iri-na-ise na orú na iri na anọ. 8 Umu-ndikom Bekea kwa; Zemira, na Joash, na Elieza, na Elioenai, na Ọmri, na Jeremot, na Abaija, na Anatot, na Alemet. Ndia nile bu umu-ndikom Bekea. 9 Edewo kwa ha n'akwukwọ-osuso-ọmumu, dika osuso-ọmumu nile ha si di, ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha, ndi-dike bu dìnkpà, ha di orú nnù uzọ abua na nnù iri na ọgu iri. 10 Umu-ndikom Jediael kwa; Bilhan: umu-ndikom Bilhan kwa; Jeush, na Benjamin, na Ihud, na Keneana, na Zetan, na Tashish, na Ahishaha. 11 Ndia nile bu umu Jediael, dika ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha si di, ndi-dike bu dìnkpà, ha di orú nnù uzọ abua na nnù atọ, ndi nāpukuru usu-ndi-agha ibu agha. 12 Shupim kwa, na Hupim, bú umu Ia, na Hushim, bú umu Ahea. 13 Umu-ndikom Naftali; Jahaziel, na Guni, na Jiza, na Shalum, bú umu Bilha. 14 Umu-ndikom Manase; Asriel, onye nwunye-ya muru: (iko-ya nwayi, bú nwayi Eram, muru Makia nna Gilead: 15 Makia we luru nwunye n'etiti Hupim na n'etiti Shupim, aha nwa-nne-ya nwayi bu kwa Meaka; ) aha nwa nke-abua bu kwa Zelọfehad: ma Zelọfehad nwere umu-ndinyom. 16 Meaka, bú nwunye Makia, we mua nwa-nwoke, o we kpọ aha-ya Peresh; aha nwa-nne-ya nwoke bu Sheresh; umu-ya ndikom bu Ulam na Rakem. 17 Umu-ndikom Ulam kwa; Bedan. Ndia bu umu Gilead, nwa Makia, nwa Manase. 18 Nwa-nne-ya nwayi, bú Hamoleket, we mua Ishhod, na Abieza, na Mahla. 19 Umu-ndikom Shemida bu kwa Ahian, na Shekem, na Likhi, na Aniam. 20 Umu-ndikom Efraim kwa; Shutela, na Bered nwa-ya, na Tahat nwa-ya, na Eleada nwa-ya, na Tahat nwa-ya, 21 na Zabad nwa-ya, na Shutela nwa-ya, na Eza, na Elead, ndi ndikom Gat, ndi amuru n'ala, b͕uru, n'ihi na ha ridatara ichiri anu-ulo-ha. 22 Efraim, bú nna-ha, we rue újú ọtutu ubọchi, umu-nne-ya we bia ikasi ya obi. 23 O we bakuru nwunye-ya, o we turu ime, mua nwa-nwoke, nna-ya we kpọ aha-ya Beria, n'ihi na ulo-ya di n'ọnọdu ọjọ. 24 Nwa-ya nwayi bu Sheera, onye wuru Bet-horon di n'okpuru, na nke di n'elu, na Uzen-sheera. 25 Refa bu kwa nwa-ya, na Reshef, na Tela nwa-ya, na Tahan nwa-ya; 26 Ladan nwa-ya, Amaihud nwa-ya, Elishama nwa-ya; 27 Nun nwa-ya, Joshua nwa-ya. 28 Ihe-onwunwe nile ha na ebe-obibi nile ha bu Bet-el na umu-obodo-ya, na n'akuku ọwuwa-anyanwu Naaran, na n'akuku Ọdida-anyanwu Gezea na umu-obodo-ya; na Shekem na umu-obodo-ya, rue Aza na umu-obodo-ya: 29 na n'akuku umu Manase, Bet-shean na umu-obodo-ya, Teanak na umu-obodo-ya, na Megido na umu-obodo-ya, na Doa na umu-obodo-ya. Nime ndia ka umu Josef nwa Israel biri. 30 Umu-ndikom Asha; Imna, na Ishva, na Ishvi, na Beria, na Sera, bú nwa-nne-ha nwayi. 31 Umu-ndikom Beria kwa; Heba, na Malkiel, onye ahu bu nna Biazait. 32 Heba we mua Jaflet, na Shoma, na Hotam, na Shua nwa-nne-ha nwayi. 33 Umu-ndikom Jaflet kwa; Pasak, na Bimhal, na Ashvat. Ndia bu umu Jaflet. 34 Umu-ndikom Shema kwa; Ahi, na Rohga, na Jehuba, na Eram. 35 Umu-ndikom Helem nwa-nne-ya kwa; Zofa, na Imna, na Shelesh, na Amal. 36 Umu-ndikom Zofa; Sua, na Hanefa, na Shual, na Beri, na Imra; 37 Beza, na Hod, na Shama, na Shilsha, na Itran, na Beera. 38 Umu-ndikom Jeta kwa; Jefune, na Pispa, na Ara. 39 Umu-ndikom Ula kwa; Ara, na Haniel, na Rizia. 40 Ndia nile bu umu Asha, ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha, ndi arọputara arọputa, ndi-dike bu dìnkpà, ha bu ndi-isi nke ndi-isi. Edewo kwa ha n'akwukwọ-osuso-ọmumu, nime usu-ndi-agha, n'ibu-agha, ọnu-ọgugu-ha bu orú nnù ndikom uzọ atọ na nnù ise.

1 Ihe Emere 8

1 Benjamin we mua Bela, bú ọkpara-ya, na Ashbel, bú nke-abua, na Ahara, bú nke-atọ; 2 na Noha, bú nke-anọ, na Rafa, bú nke-ise. 3 Bela we nwe umu-ndikom; Ada, na Gira, na Abaihud; 4 na Abishua, na Neaman, na Ahoa; 5 na Gira, na Shefufan, na Huram. 6 Ndia bu kwa umu-ndikom Ihud: ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi bi na Geba, ha we me ka ha je biri na Manahat: 7 na Neaman, na Ahaija, na Gira, onye ahu mere ka ha je biri n'ala ọzọ; ọ mua Uza na Ahaihud. 8 Shaharaim we mua umu n'ọhia Moab, mb͕e o zilagasiri ha; Hushim na Baara bu ndinyom-ya. 9 O we site na Hodesh, bú nwunye-ya, mua Jobab, na Zibia, na Misha, na Malkam; 10 na Jeuz, na Shakia, na Miama. Ndia bu umu-ya ndikom, ha bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna. 11 O site-kwa-ra na Hushim mua Abaitub na Elpaal. 12 Umu-ndikom Elpaal; Iba, na Misham, na Shemed; onye ahu wuru Ono na Lod, na umu-obodo-ya: 13 na Beria, na Shema; ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi bi n'Ajalon, ha onwe-ha mere ka ndi bi na Gat b͕alaga; 14 na Ahio, na Shashak, na Jeremot; 15 na Zebadaia, na Arad, na Eda; 16 na Maikael, na Ishpa, na Joha, bú umu-ndikom Beria; 17 na Zebadaia, na Meshulam, na Hizki, na Heba; 18 na Ishmerai, na Izlia, na Jobab, bú umu-ndikom Elpaal; 19 na Jakim, na Zikri, na Zabdi; 20 na Elienai, na Ziletai, na Eliel; 21 na Adaia, na Beraia, na Shimrat, bú umu-ndikom Shimai; 22 na Ishpan, na Iba, na Eliel; 23 na Abdon, na Zikri, na Henan; 24 na Hananaia, na Ilam, na Antot a; 25 na Ifdeia, na Penuel, bú umu-ndikom Shashak; 26 na Shamsherai, na Sheharia, na Atalaia; 27 na Jaareshia, na Elaija, na Zikri, bú umu-ndikom Jeroham. 28 Ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna n'osuso-ọmumu nile ha, ndi-isi. Ndia biri na Jerusalem. 29 Ma nime Gibeon ka nna Gibeon biri, bú Jeiel, aha nwunye-ya bu Meaka: 30 nwa-ya, bú ọkpara, bú Abdon, na Zua, na Kish, na Beal, na Nedab; 31 na Gedoa, na Ahio, na Zeka. 32 Miklot we mua Shimea. Ha onwe-ha we so kwa umu-nne-ha biri na Jerusalem, na ncherita-iru umu-nne-ha. 33 Nea we mua Kish; Kish mua Sọl; Sọl mua Jonatan, na Malki-shua, na Abinadab, na Eshbeal. 34 Nwa-nwoke Jonatan bu Merib-beal; Merib-beal we mua Maika. 35 Umu-ndikom Maika kwa; Piton, na Melek, na Tarea, na Ehaz. 36 Ehaz we mua Jehoada; Jehoada we mua Alemet, na Azmavet, na Zimri; Zimri we mua Moza: 37 Moza mua Binea; Rafa bu nwa-ya, Eleasa nwa-ya, Azel nwa-ya: 38 Azel nwere umu-ndikom isi, ndia bu kwa aha-ha; Azrikam, na Bokeru, na Ishmael, na Shearia, na Obadaia, na Henan. Ndia nile bu umu-ndikom Azel. 39 Umu-ndikom Ishek nwa-nne-ya nwoke kwa; Ulam, bú ọkpara-ya, na Jeush, bú nke-abua, na Elifelet, bú nke-atọ. 40 Umu Ulam we buru ndi-dike bu dìnkpà, ndi-ọb͕a-uta, ha nwe-kwa-ra ọtutu umu-ndikom, na umu umu, ọgu asa na iri. Ndia nile sitere n'umu Benjamin.

1 Ihe Emere 9

1 Ewe de Israel nile n'akwukwọ-osuso-ọmumu; ma, le, edere ha n'akwukwọ ndi-eze Israel: ma emere ka Juda je biri na Babilon n'ihi nmekpu ha mekpuru. 2 Ma ndi-obibi mbu ndi bi n'ihe-onwunwe-ha n'obodo nile ha bu, Israel, ndi-nchu-aja, ndi Livai, na Netinim. 3 Ma ufọdu nime umu Juda, na ufọdu nime umu Benjamin, na ufọdu nime umu Efraim na Manase, biri na Jerusalem; 4 Utai nwa Amihud, nwa Ọmri, nwa Imri, nwa Bani, onye sitere n'umu Perez nwa Juda. 5 Ndi sitere na ndi Shailo; Asaia, bú ọkpara, na umu-ya ndikom. 6 Ndi sitere n'umu Zera; Jeuel, na umu-nne-ha, nnù madu na ọgu iri-na-anọ na iri. 7 Ndi sitere n'umu Benjamin; Salu nwa Meshulam, nwa Hodavaia, nwa Hasenua; 8 na Ibneia nwa Jeroham, na Ila nwa Uzi, nwa Mikri, na Meshulam nwa Shefataia, nwa Reuel, nwa Ibnija; 9 na umu-nne-ha, dika osuso-ọmumu nile ha si di, nnù madu abua na ọgu asa na iri na isi. Ndikom ndia nile bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna diri ulo nke ndi bu nna-ha. 10 Ndi sitere na ndi-nchu-aja; Jedaia, na Jehoiarib, na Jakin; 11 na Azaraia nwa Hilkaia, nwa Meshulam, nwa Zedok, nwa Meraiot, nwa Ahaitub, bú onye-ndú ulo Chineke; 12 na Adaia nwa Jeroham, nwa Pashhua, nwa Malkija, na Maasai nwa Adiel, nwa Jahzera, nwa Meshulam, nwa Meshilemit, nwa Imea; 13 na umu-nne-ha, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha nwere, nnù madu anọ na ọgu asatọ; ndi-dike ndi bu dìnkpà ije ozi òfùfè ulo Chineke. 14 Ndi sitere na ndi Livai; Shemaia nwa Hashub, nwa Azrikam, nwa Hashabaia, site n'umu Merari; 15 na Bakbaka, na Heresh, na Galal, na Matanaia nwa Maika, nwa Zikri, nwa Esaf; 16 na Obadaia nwa Shemaia, nwa Galal, nwa Jedutun, na Berekaia nwa Esa, nwa Elkena, onye bi n'obodo ntà ndi Netofa. 17 Ndi-ọnu-uzọ-ama kwa; Shalum, na Akub, na Talmon, na Ahaiman, na umu-nne-ha: Shalum bu onye-isi; 18 ma ha nọ rue ub͕u a n'ọnu-uzọ-ama eze n'akuku ọwuwa-anyanwu: ndi ahu bu ndi-ọnu-uzọ-ama nke ọmuma-ulo-ikwū umu Livai nwere. 19 Ma Shalum nwa Kora, nwa Ebiasaf, nwa Kora, na umu-nne-ya, nke ulo nna-ya, bú ndi Kora, bu ndi-isi ije-ozi òfùfè ahu, ndi-nche nbata-uzọ nile nke ulo-ikwū: ndi bu nna-ha buri ndi-isi ọmuma-ulo-ikwū Jehova, ndi-nche uzọ-nbata; 20 Finehas nwa Eleeza bu kwa onye-ndú-ha na mb͕e gara aga, Jehova nọyere ya. 21 Zekaraia nwa Meshelemaia bu onye-ọnu-uzọ-ama nke ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute. 22 Ndia nile arọputara ibu ndi-ọnu-uzọ-ama nime nbata-uzọ nile di ọgu iri na iri na abua. Edere ndi ahu n'akwukwọ-osuso-ọmumu-ha n'obodo ntà ha, ndi ahu ka Devid na Samuel onye-ọhu-uzọ doro n'ọnọdu-ha, bú ọnọdu nke ndi kwesiri ntukwasi-obi. 23 Ndi ahu na umu-ha bu kwa ndi-isi ọnu-uzọ-ama nile diri ulo Jehova, bú ulo nke ulo-ikwū ahu, n'ihe-ndebe. 24 N'akuku anọ ka ndi-ọnu-uzọ-ama nọ, n'Ọwuwa-anyanwu, na n'akuku Ọdida-anyanwu, na n'akuku Ugwu, na n'akuku Ndida. 25 Ma umu-nne-ha, n'obodo ntà nile ha, nwe ibata kwa-ubọchi-asa site na mb͕e rue mb͕e, inọyere ha: 26 n'ihi na n'ọnọdu ndi kwesiri ntukwasi-obi ka ha nọ, bú ndi-dike anọ nke ndi-ọnu-uzọ-ama, ha onwe-ha bu ndi Livai, ha bu kwa ndi-isi ime-ulo nile na ndi-isi ulo-àkù nile nke ulo Chineke. 27 Buruburu ulo Chineke ka ha nānọ kwa ọnọdu-abali, n'ihi na n'isi-ha ka ndebe di, ha onwe-ha nwe-kwa-ra imeghe ya kwa-ututu. 28 Ufọdu nime ha bu kwa ndi-isi ihe òfùfè; n'ihi na n'ọnu-ọgugu ka ha nāchibata ha, n'ọnu-ọgugu kwa ka ha nāchipu ha. 29 Ufọdu nime ha kwa ka agutara ibu ndi-isi ihe, bú ibu ndi-isi ihe nile nke ebe nsọ ahu, na ibu ndi-isi utu ọka flour, na manya-vine, na manu, na frankincense, na uda di iche iche. 30 Ufọdu nime umu ndi-nchu-àjà nāsugwa kwa manu-otite nēsì ísì utọ nke uda di iche iche. 31 Matitaia kwa, otù onye nime ndi Livai, onye ahu bu ọkpara Shalum onye Kora, ọ nọ n'ọnọdu ndi kwesiri ntukwasi-obi ibu onye-isi nke ihe esiri n'ite isi ihe. 32 Ufọdu nime umu ndi Kohat, bú ufọdu nime umu-nne-ha, bu ndi-isi achicha anēdo n'usoro, idozi ya kwa-ubọchi-izu-ike. 33 Ndia kwa bu ndi-ọbù-abù, ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi Livai, ndi bi n'ime-ulo, ndi puru n'òfùfè ọzọ: n'ihi na ehihie na abali ha bu ndi-isi-ha n'ije-ozi ahu. 34 Ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi Livai n'osuso-ọmumu nile ha, ndi-isi: ndia biri na Jerusalem. 35 Ma nime Gibeon ka nna Gibeon biri, bú Jeiel, aha nwunye-ya bu Meaka: 36 na nwa-ya, bú ọkpara, bú Abdon, na Zua, na Kish, na Beal, na Nea, na Nedab; 37 na Gedoa, na Ahio, na Zekaraia, na Miklot. 38 Miklot we mua Shimeam. Ha onwe-ha we so kwa umu-nne-ha biri na Jerusalem, na ncherita-iru umu-nne-ha. 39 Nea we mua Kish; Kish mua Sọl; Sọl mua Jonatan, na Malki-shua, na Abinadab, na Eshbeal. 40 Nwa-nwoke Jonatan bu Merib-beal; Merib-beal we mua Maika. 41 Umu-ndikom Maika kwa; Piton, na Melek, na Tahrea, na Ehaz. 42 Ehaz we mua Jara; Jara mua Alemet, na Azmavet, na Zimri; Zimri we mua Moza; 43 Moza mua Binea; Refaia bu kwa nwa-ya, Eleasa nwa-ya, Azel nwa-ya: 44 Azel nwere umu-ndikom isi, ndia bu kwa aha-ha; Azrikam, na Bokeru, na Ishmael, na Shearia, na Obadaia, na Henan: ndia bu umu-ndikom Azel.

1 Ihe Emere 10

1 Ma ndi Filistia busoro Israel agha: ndikom Israel we b͕alaga n'iru ndi Filistia, ha we da, buru ndi eb͕uru eb͕u n'ugwu Gilboa. 2 Ndi Filistia we sosie ike n'azu Sọl na n'azu umu-ya ndikom; ndi Filistia we tib͕ue Jonatan, na Abinadab, na Malki-shua, bú umu-ndikom Sọl. 3 Agha ahu we di arọ́ megide Sọl, ndi-ọb͕a-uta we huta ya; o we nēb͕u ya nb͕u site n'ib͕a-uta nke ndi-ọb͕a-uta. 4 Sọl we si onye nēbu ihe-agha-ya, Miputa nma-agha-gi, were ya mapuem aru; ka ndia anēbìghi úgwù ghara ibia kwam emò. Ma onye nēbu ihe-agha-ya ekweghi; n'ihi na ọ nātu egwu nke-uku. Sọl we were mma-agha-ya, dakwasi ya. 5 Onye nēbu ihe-agha-ya we hu na Sọl anwuwo, ya onwe-ya we dakwasi kwa na mma-agha-ya, nwua. 6 Sọl we nwua, ya na umu-ya ndikom atọ; ulo-ya nile nwu-kwa-ra n'otù. 7 Ndikom Israel nile ndi nọ na ndagwurugwu ahu we hu na ha ab͕alagawo, na Sọl na umu-ya ndikom anwuwo kwa, ha we rapu obodo nile ha b͕alaga; ndi Filistia we bia biri nime ha. 8 O rue, n'echi-ya, mb͕e ndi Filistia biaru ibupu ihe ndi eb͕uru eb͕u, na ha huru Sọl ma umu-ya ndikom ka ha tọb͕ọrọ n'ugwu Gilboa. 9 Ha we yipu ihe-agha-ya, būru isi-ya na ihe-agha-ya, ziga n'ala ndi Filistia buruburu, izisara arusi nile ha na ndi-ha ozi ahu. 10 Ha we dọba ihe-agha-ya n'ulo chi-ha, kpọgide okpokoro-isi-ya n'ulo Degon. 11 Jebesh-gilead nile we nu ihe nile ndi Filistia mere Sọl, 12 ndikom nile bu dìnkpà we bilie, būru ozu Sọl na ozu umu-ya ndikom, bubata ha na Jebesh, lìe ọkpukpu-ha n'okpuru osisi terebinth nime Jebesh, bue ọnu ubọchi asa. 13 Sọl we nwua n'ihi nmekpu-ya o mekpuru megide Jehova, n'ihi okwu Jehova, nke ọ nēdebegh: ọzọ kwa, n'ihi na ọ juru ase n'aka onye nwere mọ ọ nāju ihe, iji ya ju ase, 14 ma ọ jughi Jehova ase: O we me ka ọ nwua, O we chigharia ala-eze nye Devid nwa Jesi.

1 Ihe Emere 11

1 Israel nile we chikọta onwe-ha n'ebe Devid nọ rue Hebron, si, Le, ọkpukpu-gi na anu-aru-gi ka ayi bu. 2 Na mb͕e gara aga, ọbuná mb͕e Sọl bu eze, gi onwe-gi bu onye nēdupu na onye nēdubata Israel: Jehova, bú Chineke-gi, we si gi, Gi onwe-gi gāzù ndim, bú Israel, gi onwe-gi gābu kwa onye-ndú ndim, bú Israel. 3 Ndi-okenye nile nke Israel we biakute eze rue Hebron; ha na Devid we b͕a ndu nime Hebron n'iru Jehova; ha we te Devid manu ibu eze Israel, dika okwu Jehova n'aka Samuel si di. 4 Devid na Israel nile we jerue Jerusalem (nke ahu bu Jebus); ma n'ebe ahu ka ndi Jebus, ndi bi n'ala ahu, nọ. 5 Ndi bi na Jebus we si Devid, I gaghi-abata n'ebe a. Devid we were ebe ewusiri ike nke Zaion; nke ahu bu obodo Devid. 6 Devid we si, Onye ọ bula nke buru uzọ tib͕u ndi Jebus gābu onye-isi na ọchi-agha. Joab nwa Zeruaia we buru uzọ rigo, o we buru onye-isi. 7 Devid we biri n'ebe ahu ewusiri ike; n'ihi ya ka ha kpọrọ ya obodo Devid. 8 O we wue obodo buruburu, site na Milo we rue buruburu ya: ma Joab mere ka obodo fọduru di ndu. 9 Devid we nāga n'iru, nēje nādi uku; Jehova nke usu nile nke ndi-agha nọye-kwa-ra ya. 10 Ma ndia bu ndi-isi nke ndi-dike Devid nwere, ndi mere onwe-ha ka ha di ike n'akuku ya n'ala-eze-ya, ha na Israel nile, ime ya eze, dika okwu Jehova si di bayere Israel. 11 Nka bu kwa ọnu-ọgugu ndi-dike Devid nwere: Jashọbeam, bú nwa onye-Hakmonait, onye-isi nke orú na iri ahu; o feghariri ube-ya imegide ọgu ndikom iri-na-ise, ha we ghọ ndi eb͕uru eb͕u n'otù ub͕ò. 12 Nke so ya bu Eleeza nwa Dodo, onye Ahoa, onye ahu di n'etiti ndi-dike atọ ahu. 13 Onye ahu nọyere Devid nime Pas-damim, ma ndi Filistia chikọtara onwe-ha n'ebe ahu ibu agha, òkè ubi nke juputara n'ọka barley di kwa; ma ndi Israel b͕alagara n'iru ndi Filistia. 14 Ha we guzo onwe-ha n'etiti òkè ahu, naputa ya, tib͕ue ndi Filistia; Jehova we zọputa nzọputa uku. 15 Ndikom atọ n'etiti orú ndi-isi na iri ahu we ridarue oké nkume ahu jekuru Devid, rue ọb͕à Adulam; ma ọmuma-ulo-ikwū ndi-Filistia amawo ulo-ikwū-ha na ndagwurugwu Refaim. 16 Ma Devid nọ n'ebe ahu ewusiri ike mb͕e ahu, ma ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia di na Bet-lehem mb͕e ahu. 17 Devid we chọsie ike, si, Ònye gēme ka m'ṅua miri sitere n'olùlù-miri Bet-lehem, nke di n'ọnu-uzọ-ama? 18 Ndikom atọ ahu we wapue ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia, sere miri n'olùlù-miri Bet-lehem, nke di n'ọnu-uzọ-ama, ha we būru ya, kutere Devid: ma Devid ekweghi iṅu ya, o we wusiere ya Jehova, 19 si, Ya burum ihe-árú sitere na Chinekem, ime ihe a: #m'gāṅu ọbara ndikom ahu ndi ji ndu-ha n'aka-ha je? n'ihi na ha ji ndu-ha n'aka-ha kute ya. O kweghi kwa iṅu ya. Ihe ndia ka ndi-dike atọ ahu mere. 20 Ma Abishai, bú nwa-nne Joab, onye ahu bu onye-isi ndikom atọ ahu: onye ahu feghari-kwa-ra ube-ya imegide ọgu ndikom iri-na-ise, ha we ghọ ndi eb͕uru eb͕u, o we nwe aha n'etiti ndikom atọ ahu. 21 N'etiti ndikom atọ ahu anāsọpuru ya kari abua fọduru, o we ghọrọ ha onye-isi: ma o rughi ndikom atọ mbu ahu. 22 Benaia nwa Jehoiada, nwa nke nwoke bu dìnkpà nke Kabzeel, onye di uku n'ime ihe, onye ahu tib͕uru umu-ndikom abua nke Ariel nke Moab: onye ahu rida-kwa-ra tib͕ue ọdum n'etiti olùlù n'ubọchi snow nēzò. 23 Onye ahu tib͕u-kwa-ra nwoke ahu, bú onye Ijipt, nwoke toro ogologo, cubit ise; ube di kwa n'aka onye Ijipt ahu dika oké ókpòrò di arọ́ nke ọkpa-ákwà ji akpa ákwà; ma o ji nkpa-n'aka ridakuru ya, napu ube ahu n'aka onye Ijipt n'ike, were ube-ya b͕ue ya. 24 Ihe ndia ka Benaia nwa Jehoiada mere, we nwe aha n'etiti ndi-dike atọ ahu. 25 Le, anāsọpuru ya kari orú ndikom na iri ahu, ma o rughi ndikom atọ mbu ahu: Devid we do ya onye-isi ndi nānu okwu-ya. 26 Ndi-dike nke usu nile nke ndi-agha kwa; Asahel nwa-nne Joab, Elhanan nwa Dodo nke Bet-lehem; 27 Shamot onye Haroa, Hilez onye-Pelonait; 28 Ira nwa Ikesh onye Tekoa, Abieza onye Anatot; 29 Sibekai onye Husha, Ilai onye Ahoa; 30 Maharai onye Netofa, Hiled nwa Beana onye Netofa; 31 Itai nwa Ribai nke Gibea umu Benjamin, Benaia onye Piraton; 32 Hurai nke miri-iyi Gaash, Abiel onye Araba; 33 Azmavet onye Bahurim, Eliahba onye Shaalabin; 34 nke umu Hashem onye-Gaizonait, Jonatan nwa Shagei onye-Hararait; 35 Ahiam nwa Saka onye-Hararait, Elifal nwa Ua; 36 Hefa onye-Mekeratait, Ahaija onye-Pelonait; 37 Hezro onye Kamel, Naarai nwa Ezbai; 38 Joel nwa-nne Netan, Mibha nwa Hagri; 39 Zelek onye Amon, Naharai onye Beirot, onye nēbu ihe-agha Joab nwa Zeruaia; 40 Ira onye Jeta, Gareb onye Jeta; 41 Uraia onye Het, Zabad nwa Ahlai; 42 Adina nwa Shiza onye Reuben, onye-isi ndi Reuben, orú ndikom na iri so-kwa-ra ya; 43 Henan nwa Meaka, na Joshafat onye-Mitnait; 44 Uzia onye Ashterot, Shama na Jeiel, bú umu Hotam onye Aroea; 45 Jediael nwa Shimri, na Joha nwa-nne-ya, onye-Tizait; 46 Eliel onye-Mahavait, na Jeribai, na Joshavia, umu Elnaam, na Itma onye Moab; 47 Eliel, na Obed, na Jaasiel onye-Mezobait.

1 Ihe Emere 12

1 Ma ndia bu ndi nābiakute Devid rue Ziklag, mb͕e anọ̀ nēmechibido ya n'ihi Sọl nwa Kish: ndi ahu di kwa n'etiti ndi-dike-ya, ndi nēyere ya aka n'agha ahu. 2 Ha nāchi uta, nēme aka-nri nēme kwa aka-ekpe n'itu nkume na n'iwere uta b͕a àkú; ha sitere n'umu-nne Sọl site na Benjamin. 3 Onye-isi bu Ahieza, na Joash, bú umu Shemaa onye Gibea; na Jeziel, na Pelet, bú umu Azmavet; na Beraka, na Jihu onye Anatot; 4 na Ishmaia onye Gibeon, bú dike n'etiti orú ndikom na iri ahu, na onye-isi orú na iri ahu; na Jeremaia, na Jahaziel, na Johanan, na Jozabad onye Gedira; 5 Eluzai, na Jerimot, na Bealia, na Shemaraia, na Shefataia onye-Harufait; 6 Elkena, na Ishia, na Azarel, na Joeza, na Jashọbeam, bú ndi Kora; 7 na Joela, na Zebadaia, bú umu Jeroham nke Gedoa. 8 Ufọdu nime ndi Gad kewaputa-kwa-ra onwe-ha jekuru Devid rue ebe ahu ewusiri ike n'ọzara, ndi-dike bu dìnkpà, ndikom usu-ndi-agha ibu agha, ndi nēdo ọta na ube n'usoro; iru-ha bu kwa iru ọdum, ha di kwa ngwa dika mb͕ada n'elu ugwu; 9 Iza, bú onye-isi, Obadaia, bú nke-abua, Elaiab, bú nke-atọ; 10 Mishmana, bú nke-ano, Jeremaia, bú nke-ise; 11 Atai, bú nke-isi, Eliel, bú nke-asa; 12 Johanan, bú nke-asatọ, Elzabad, bú nke-iteghete; 13 Jeremaia, bú nke-iri, Makbanai, bú nke-iri-na-otù. 14 Ndia, ndi sitere n'umu Gad, bu ndi-isi usu-ndi-agha: onye kachasi ntà ra ka ọgu ndikom ise, onye kachasi uku ra kwa ka nnù ndikom abua na ọgu iri. 15 Ndia bu ndikom ahu ndi gabigara Jọdan n'ọnwa mbu, mb͕e osimiri ahu nēruchi usọ-ya nile; ha we me ka ndi ndagwurugwu nile b͕alaga, ma n'Ọwuwa-anyanwu ma n'Ọdida-anyanwu. 16 Ufọdu nime umu Benjamin na Juda we biarue ebe ahu ewusiri ike biakute Devid. 17 Devid we pua izute ha, o we za, si ha, Ọ buru na unu abiakutem n'uzọ udo iyerem aka, enwerem obi ọma n'aru unu ka mu na unu buru otù: ma ọ buru na unu abiawo iwere aghughọ nyem n'aka ndi nākpab͕um, mb͕e ihe-ike nādighi n'akam, ka Chineke nna-ayi-hà hu ya, bara unu nba. 18 Mọ nke Chineke we yiri Amasai, bú onye-isi ndi-ọchi-agha ahu, dika uwe, o we si, Nke gi ka ayi bu, Devid, n'akuku gi ka ayi nọ kwa, nwa Jesi: udo, udo diri gi, udo di-kwa-ra onye nēyere gi aka; n'ihi na Chineke-gi enyeworo gi aka. Devid we nara ha, me ha ndi-isi usu ndi nāpunara madu ihe. 19 Ufọdu nime Manase dinyekwara Devid, mb͕e o soro ndi Filistia bia imegide Sọl n'agha, ma ha eyeghi ha aka: n'ihi na ndi-isi ndi Filistia were idu-ọdu zilaga ya, si, Ọ gēwere isi-ayi danyere onye-nwe-ya, bú Sọl. 20 Mb͕e ọ nāla na Ziklag, ndia sitere na Manase danyere ya, bú Adna, na Jozabad, na Jediael, na Maikael, na Jozabad, na Elaihu, na Ziletai, bú ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri ndi diri Manase. 21 Ndi ahu ye-kwa-ra Devid aka imegide usu ndi nāpunara madu ihe: n'ihi na ndi-dike bu dìnkpà ka ha nile bu, ha we buru ndi-isi n'usu-ndi-agha. 22 N'ihi na mb͕e ahu ha nābiakute Devid kwa-ubọchi iyere ya aka, rue mb͕e ọ bu ọmuma-ulo-ikwū, dika ọmuma-ulo-ikwū Chineke. 23 Ndia bu kwa ọnu-ọgugu ndi-isi nke ndi ejikere iso usu-ndi-agha; ha biakutere Devid nime Hebron ichighari ala-eze Sọl nye ya, dika okwu-ọnu Jehova si di. 24 Umu Juda ndi nēbu ọta na ube di nnù iri-na-asa, ndi ejikere iso usu-ndi-agha. 25 Site n'umu Simeon, ndi-dike bu dìnkpà iso usu-ndi-agha, nnù iri-na-asa na ọgu iri-na-ise. 26 Site n'umu Livai, nnù iri-na-otù na ọgu iri. 27 Jehoiada bu onye-ndú ndi Eron, nnù ndikom iteghete na ọgu ise so-kwa-ra ya; 28 na Zedok, bú nwa-okorọbia nke bu dike bu dìnkpà, na nke ulo nna-ya orú ndi-isi na abua. 29 Site kwa n'umu Benjamin, bú umu-nne Sọl, nnù asa na ọgu iri: n'ihi na rue mb͕e ahu ndi ka n'ọnu-ọgugu nime ha nēdebe ihe-ndebe ulo Sọl. 30 Site kwa n'umu Efraim, orú nnù uzọ abua na nnù iri-na-abua, ha bu ndi-dike bu dìnkpà, ndikom amara aha-ha n'ulo nke ndi bu nna-ha. 31 Site kwa na nkera ebo Manase, orú nnù uzọ abua na nnù ise, ndi akpọrọ n'aha n'aha, ibia ime Devid eze. 32 Site kwa n'umu Isaka, bú ndi mara nghọta bayere mb͕e ahu nile, imara ihe Israel gēme; ndi-isi-ha bu ọgu iri; umu-nne-ha nile nēme kwa dika okwu-ọnu-ha si di. 33 Site na Zebulun, ndi nāpukuru usu-ndi-agha, ndi nēdo agha n'usoro, ndi chiri ihe-agha nile, orú nnù uzọ isi na nnù ise; ndi nēdo onwe-ha n'usoro, nēnweghi obi abua. 34 Site kwa na Naftali, nnù ndi-isi abua na ọgu iri, orú nnù ndikom uzọ anọ na nnù iri-na-abua na ọgu iri so-kwa-ra ha nāchi uta na ube. 35 Site kwa na ndi Dan, bú ndi nēdo agha n'usoro, orú nnù uzọ atọ na nnù iri-na-otù na ọgu iri. 36 Site kwa n'Asha, bú ndi nāpukuru usu-ndi-agha ido agha n'usoro, orú nnù uzọ ise. 37 Site kwa n'ofè Jọdan, site n'umu Reuben, na ndi Gad, na nkera ebo Manase, bú ndi nāchi ihe nile nke usu-ndi-agha iji bu agha, orú nnù uzọ iri-na-ise. 38 Ndia nile, bú ndikom agha, ndi nēdo agha n'usoro, were obi zuru okè biarue Hebron, ime Devid eze Israel nile: ọzọ kwa, ndi Israel nile nke fọduru nwere otù obi ime Devid eze. 39 Ha na Devid we nọ n'ebe ahu ubọchi atọ nēri ihe nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu: n'ihi na umu-nne-ha doziri ha ihe. 40 Ọzọ kwa, ndi bi ha nso, rue Isaka na Zebulun na Naftali, nēweta achicha n'elu inyinya-ibu na n'elu camel, na n'elu inyinya mule, na n'elu ehi, ihe-oriri nke utu ọka, na mbadamba fig, na uyọkọ nkpuru-vine amiri ami, na manya-vine, na manu, na ìgwè ehi, na ìgwè ewu na aturu n'uba: n'ihi na ọṅù di n'Israel.

1 Ihe Emere 13

1 Devid we me ka ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri na usu nile nke ọgu ndikom ise dua ya ọdu, bú onye-ndú ọ bula. 2 Devid we si nkpọkọta nile nke Israel, Ọ buru na ọ di unu nma, ọ buru kwa na o sitere na Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi zisara umu-nne-ayi ozi n'ebe nile, bú ndi fọduru n'ala nile nke Israel, ha na ndi-nchu-àjà na ndi Livai ndi bi n'obodo ebe-ita-nri nile ha, ka ha we chikọta onwe-ha n'ebe ayi nọ: 3 ka ayi bughachi kwa ib͕e Chineke-ayi n'ebe ayi nọ: n'ihi na ayi achọghi ya n'ubọchi Sọl. 4 Nkpọkọta ahu nile we si na ha gēme otú a: n'ihi na okwu ahu ziri ezi n'anya ndi Israel nile. 5 Devid we kpọkọta Israel nile, site na Shaihoa nke Egypt we rue nbata Hemat, ime ka ib͕e Chineke si na Kiriat-jearim bia. 6 Devid we rigo, ya na Israel nile, rue Beala, rue Kiriat-jearim, nke Juda nwere, isi n'ebe ahu bugota ib͕e Chineke, bú Jehova, Onye nānọkwasi cherubim, nke akpọkwasiri Aha ahu. 7 Ha we me ka ub͕ọ-ala ọhu būru ib͕e Chineke, ha we buputa ya n'ulo Abinadab: Uza na Ahio we nēdu ub͕ọ-ala ahu. 8 Devid na Israel nile nēwere ike-ha nile gba egwú n'iru Chineke, were kwa abù, were kwa ubọ-akwara, na une, na egwú-otiti, na ájà, na opì. 9 Ha we biarue ebe-nzọcha-ọka Kidon, Uza we setia aka-ya ijide ib͕e ahu; n'ihi na ehi nāb͕a ukwu. 10 Iwe Jehova we di ọku megide Uza, O we tib͕ue ya, n'ihi na o setiri aka-ya metu ib͕e ahu: o we nwua n'ebe ahu n'iru Chineke. 11 Iwe Devid we di ọku, n'ihi na Jehova tiwaputara ntiwa megide Uza: o we kpọ ebe ahu Perez-uza, rue ta. 12 Devid we tua egwu Chineke n'ubọchi ahu, si, M'gēsi aṅa me ka ib͕e Chineke biakutem? 13 Devid ewezugaghi kwa ib͕e ahu nye onwe-ya rue obodo Devid, ma o buzugara ya rue ulo Obed-edom, bú onye Gat. 14 Ib͕e Chineke we nọdu n'ezi-na-ulo Obed-edom n'ulo-ya ọnwa atọ: Jehova we gọzie ulo Obed-edom na ihe nile o nwere.

1 Ihe Emere 14

1 Hairam, bú eze Taia, we zigara Devid ndi-ozi, na osisi cedar, na ndi-ọ̀kà na nkume, na ndi-ọ̀kà n'osisi, iwuru Devid ulo. 2 Devid we mara na Jehova emewo ya ka o guzosie ike ibu eze Israel, n'ihi na ebuliwo ala-eze-ya n'elu n'ihi ndi-Ya, bú Israel. 3 Devid we kuru ndinyom ọzọ nime Jerusalem: Devid we mua umu-ndikom na umu-ndinyom ọzọ. 4 Ndia bu kwa aha umu o nwere na Jerusalem; Shamua, na Shobab, na Netan, na Solomon; 5 na Ibha, na Elishua, na Elpelet; 6 na Noga, na Nefeg, na Jafia; 7 na Elishama, na Beeliada, na Elifelet. 8 Ndi Filistia we nu na etere Devid manu ibu eze Israel nile, ndi Filistia nile we rigo ichọ Devid: Devid we nu ya, we pua n'iru ha. 9 Ma ndi Filistia biara, nọdu na ndagwurugwu Refaim. 10 Devid we jua Chineke ase, si, M'gārigo imegide ndi Filistia? Ì gēnye kwa ha n'akam? Jehova we si ya, Rigo; M'gēnye kwa ha n'aka-gi. 11 Ha we rigorue Beal-perazim, Devid we tib͕ue ha n'ebe ahu; Devid we si, Jehova ekwopúwo megide ndi-irom site n'akam, dika nkwopú miri. N'ihi nka ka ha kpọrọ aha ebe ahu Beal-perazim. 12 Ha we rapu chi nile ha n'ebe ahu; Devid we kwue, ewe sure ha n'ọku. 13 Ndi Filistia we nọdu ọzọ na ndagwurugwu ahu. 14 Devid we jua Chineke ase ọzọ; Chineke we si ya, Arigola iso ha: si n'ebe ha nọ ga buruburu, biakute ha na ncherita-iru osisi balsam. 15 Ọ gēru kwa, mb͕e i nuru olu ikiti-ukwu n'elu osisi balsam ahu, mb͕e ahu ka i gāpu ibu agha: n'ihi na Chineke apuwo n'iru gi itib͕u ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia. 16 Devid we me dika Chineke nyere ya iwu: ha we tib͕ue ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia site na Gibeon we rue Gezea. 17 Aha Devid we pua jezue n'ala nile; Jehova we tiye ujọ-ya n'aru mba nile.

1 Ihe Emere 15

1 Devid we mere onwe-ya ulo ufọdu n'obodo Devid; o we doziere ib͕e Chineke ọnọdu, we mara ya ulo-ikwū. 2 Mb͕e ahu Devid siri, Ọ dighi onye gēbu ib͕e Chineke ma-ọbughi ndi Livai: n'ihi na ha ka Jehova rọputaworo ibū ib͕e Chineke, na ijere Ya ozi rue mb͕e ebighi-ebi. 3 Devid we kpọkọta Israel nile ibiaru Jerusalem, ibugota ib͕e Jehova rue ọnọdu-ya, nke o doziri nye ya. 4 Devid we chikọta umu Eron na ndi Livai: 5 nke umu Kohat; Uriel, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom isi: 6 nke umu Merari; Asaia, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom iri-na-otù: 7 nke umu Giashom; Joel, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom isi na iri: 8 nke umu Elizafan; Shemaia, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom iri: 9 nke umu Hebron; Eliel, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom anọ: 10 nke umu Uziel; Aminadab, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom ise na iri na abua. 11 Devid we kpọ Zedok, kpọ kwa Abaiata, bú ndi-nchu-àjà, kpọ kwa ndi Livai, bú Uriel, na Asaia, na Joel, na Shemaia, na Eliel, na Aminadab, 12 si ha, Unu onwe-unu bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna ndi Livai: donu onwe-unu nsọ, unu onwe-unu na umu-nne-unu, ka unu we bugota ib͕e Jehova, bú Chineke Israel, rue ebe m'doziri nye ya. 13 N'ihi na ọ bughi unu onwe-unu būru ya na mbu, n'ihi ya ka Jehova, bú Chineke-ayi, tiwaputara megide ayi, n'ihi na ayi achọghi Ya dika ikpé-Ya si di. 14 Ndi-nchu-àjà na ndi Livai we do onwe-ha nsọ ibugota ib͕e Jehova, bú Chineke Israel. 15 Umu ndi Livai we were nkpa-n'aka-ya abua būru ib͕e Chineke n'ubu-ha n'elu ha, dika Moses nyere iwu, dika okwu Jehova si di. 16 Devid we si ndi-isi ndi Livai ka ha me umu-nne-ha, bú ndi-ọbù-abù, ka ha guzo chiri ihe abù, bú une, na ubọ-akwara, na ájà, nēme ka anu udà-ha, iweli olu n'elu n'ihi ọṅù. 17 Ndi Livai we guzo Himan nwa Joel; na site n'umu-nne-ya, Esaf nwa Berekaia; na site n'umu Merari, bú umu-nne-ha, Itan nwa Kushaia; 18 tiye-kwa-ra ha umu-nne-ha, bú ndi nke usoro nke-abua, Zekaraia, na Ben, na Jaaziel, na Shemiramot, na Jehiel, na Uni, na Elaiab, na Benaia, na Maaseia, na Matitaia, na Elifelehu, na Mikneia, na Obed-edom, na Jeiel, bú ndi-ọnu-uzọ-ama. 19 Na ndi-ọbù-abù, bú Himan, na Esaf, na Itan, chiri ájà ọla ime ka anu udà-ha; 20 na Zekaraia, na Aziel, na Shemiramot, na Jehiel, na Uni, na Elaiab, na Maaseia, na Benaia, chiri une nke dabàra n'olu umu-ab͕ọghọ; 21 na Matitaia, na Elifelehu, na Mikneia, na Obed-edom, na Jeiel, na Azazaia, chiri ubọ-akwara nke dabàra n'octave, ibu ndi-isi nke ndi-abù. 22 Ma Kenania, bú onye-isi ndi Livai, bu isi n'ibū ibu ahu: ọ dọrọ aka na nti n'ibū ibu ahu, n'ihi na onye nwere nghọta ka ọ bu. 23 Berekaia na Elkena bu ndi-ọnu-uzọ-ama diri ib͕e ahu. 24 Shebania, na Joshafat, na Netanel, na Amasai, na Zekaraia, na Benaia, na Elieza, bú ndi-nchu-àjà, nāfù opì n'iru ib͕e Chineke: Obed-edom na Jehia bu ndi-ọnu-uzọ-ama diri ib͕e ahu. 25 Devid, na ndi-okenye Israel, na ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri, we nēje iwere ọṅù si n'ulo Obed-edom bugota ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova: 26 o rue, mb͕e Chineke yere ndi Livai ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova aka, na ha churu oke-ehi asa na ebulu asa n'àjà. 27 Ewere kwa uwe-nwuda nke ezi ákwà ọcha ke Devid ekike, ya na ndi Livai nile ndi nēbu ib͕e ahu, na ndi-ọbù-abù, na Kenania, bú onye-isi n'ibū ibu ahu tiyere ndi-ọbù-abù: ephod ákwà ọcha di kwa n'aru Devid. 28 Israel nile we were iti-nkpu, were kwa olu opì-ike, chiri kwa opì, na ájà, nēbugota ibe ọb͕ub͕a-ndu Jehova, nēwere une na ubọ-akwara me ka anu udà-ha. 29 O rue, mb͕e ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova biaruru obodo Devid, na Maikal nwa-nwayi Sọl lepuru anya na window, hu eze, bú Devid, ka ọ nāwuli, nēgwu kwa egwú; o we leda ya anya n'obi-ya.

1 Ihe Emere 16

1 Ha we bubata ib͕e Chineke, guzo ya n'etiti ulo-ikwū nke Devid mara nye ya: ha we weta nso àjà-nsure-ọku na àjà-udo n'iru Chineke. 2 Devid we surebìe àjà-nsure-ọku ahu na àjà-udo nile, gọzie ndi Israel n'aha Jehova. 3 Ọ we kesara madu ọ bula n'Israel, ma nwoke ma nwayi, madu ọ bula, otù ob͕e achicha, na otù ọkpurukpu anu, na otù mbadamba nkpuru-vine amiri ami. 4 O we tiye ufọdu nime ndi Livai n'iru ib͕e Jehova, bú ndi nēje ozi, ọbuná ime ka echeta na ikele na ito Jehova, bú Chineke Israel: 5 ha bu: Esaf, bú onye-isi, na Zekaraia, bú onye nke-abua ya, na Jeiel, na Shemiramot, na Jehiel, na Matitaia, na Elaiab, na Benaia, na Obede-edom, na Jeiel, chiri une na ubọ-akwara; Esaf nēwere kwa ájà me ka anu udà-ha; 6 Benaia na Jehaziel, bú ndi-nchu-àjà, nāchiri kwa opì mb͕e nile, n'iru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Chineke. 7 Mb͕e ahu, n'ubọchi ahu, Devid buru uzọ nye iwu ikele Jehova, site n'aka Esaf na umu-nne-ya. 8 Kelenu Jehova, kpọkuenu aha-Ya; Menu ka amara omume-Ya nile n'etiti ndi nile n'uwa. 9 Bùkuenu Ya abù, bùkuenu Ya abù ọma; Tugharinu uche n'oké ọlu-Ya nile. 10 Nētonu onwe-unu n'aha nsọ Ya: Ka obi ndi nāchọ Jehova ṅuria. 11 Nāchọnu Jehova na ike-Ya; Chọnu iru-Ya mb͕e nile. 12 Chetanu oké ọlu-Ya nile nke Ọ luworo; Ihe-ebube-Ya nile, na ikpé nile nke ọnu-Ya; 13 Unu nkpuru Israel, bú orù-Ya, Umu Jekob, ndi-Ya arọputara. 14 Ya onwe-ya bu Jehova, bú Chineke-ayi: N'uwa nile ka ikpé-Ya nile di. 15 Chetanu ọb͕ub͕a-ndu-Ya rue mb͕e ebighi ebi, Okwu O nyere nnù ọb͕ọ abua na ọgu iri n'iwu; 16 Ọb͕ub͕a-ndu nke Ya na Abraham b͕ara, Na iyi-Ya Ọ ṅuru Aisak; 17 O we me ka o guzoro Jekob ibu ukpuru, Ka o guzoro Israel ibu ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi: 18 Si, Gi ka M'gēnye ala Kenean, Bú ala-nketa-unu eji udọ̀ tùa: 19 Mb͕e unu bu ndikom ole-na-ole; E, nání madu ole-na-ole, na ndi-ọbìa nime ya; 20 Ha we nējeghari si n'otù mba jerue mba ọzọ, Si n'otù ala-eze jerue ndi ọzọ. 21 O kweghi ka nwoke ọ bula meb͕ue ha; O we bara ndi-eze nba n'ihi ha; 22 Si, Unu emetula ndim etere manu aka, Unu emejo-kwa-la ndi-amumam. 23 Bùkuenu Jehova abù, unu uwa nile; Nēzisanu ozi nzọputa-Ya site n'otù ubọchi rue ubọchi ọzọ. 24 Kọsanu akukọ nsọpuru-Ya n'etiti mba nile, Akukọ oké ọlu-Ya nile n'etiti ndi nile di iche iche. 25 N'ihi na Jehova di uku, buru kwa onye anēto nke-uku: Onye anātu egwu Ya ka Ọ bu kwa n'elu chi nile. 26 N'ihi na chi nile nke ndi nile di iche iche bu ihe-efu: Ma Jehova mere elu-igwe. 27 Ebube na ima-nma di n'iru Ya: Ike na ọṅù di n'ebe-Ya. 28 Nyenu Jehova, unu ab͕uru nke ndi nile di iche iche, Nyenu Jehova nsọpuru na ike. 29 Nyenu Jehova nsọpuru aha-Ya: Butenu onyinye-inata-iru-ọma, bia n'iru Ya: Kpọnu isi ala nye Jehova n'ima-nma nke idi-nsọ. 30 Ka o nēb͕u unu nb͕u site n'iru Ya, unu elu-uwa nile: Ọzọ, elu-uwa dum madu bi nēguzosi ike, adighi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya. 31 Ka elu-igwe ṅuria, ka uwa teghari kwa egwú ọṅù; Ka ha si kwa n'etiti mba nile, Jehova bu eze. 32 Ka oké osimiri bib͕ọ, ya na ùjú-ya; Ka obi tọ ọhia utọ, ya na ihe nile nke di nime ya; 33 Mb͕e ahu osisi nile nke oké ọhia gēti nkpu ọṅù n'iru Jehova, N'ihi na Ọ biawo ikpe uwa ikpe. 34 Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. 35 Si-kwa-nu, Zọputa ayi, Chineke nzọputa-ayi, Chikọta kwa ayi, naputa ayi n'aka mba nile, Ikele aha nsọ Gi, Na inya isi n'otuto-Gi. 36 Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke nke Israel, bu, Site na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi. Ndi Israel nile we si, Amen, ha we to Jehova. 37 O we rapu n'ebe ahu, n'iru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, Esaf na umu-nne-ya, ije ozi n'iru ib͕e ahu mb͕e nile, dika ihe ubọchi n'ubọchi-ya si di: 38 na Obed-edom na umu-nne-ha, ọgu ndikom atọ na asatọ; na Obed-edom nwa Jedutun, na Hosa, ibu ndi-ọnu-uzọ-ama: 39 na Zedok, bú onye-nchu-àjà, na umu-nne-ya, bú ndi-nchu-àjà, n'iru ebe-obibi Jehova n'ebe di elu nke di na Gibeon, 40 isurere Jehova àjà-nsure-ọku n'elu ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku mb͕e nile n'ututu na n'anyasi, ọbuná dika ihe nile si di nke edeworo n'iwu Jehova, nke O nyere Israel n'iwu; 41 ha na Himan na Jedutun, na ndi fọduru nime ndi arọputara arọputa, ndi akpọrọ n'aha n'aha, ikele Jehova, n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di; 42 ha na Himan na Jedutun, ndi chiri opì na ájà inye ndi nēme ka anu udà-ha, chiri kwa ihe abù Chineke: na umu Jedutun, inọ n'ọnu-uzọ-ama. 43 Ndi Israel nile we la, nwoke ọ bula n'ulo-ya: Devid we lata igọzi ulo-ya.

1 Ihe Emere 17

1 O rue, mb͕e Devid biri n'ulo-ya, na Devid siri Netan, bú onye-amuma, Le, mu onwem nēbi n'ulo cedar, ma ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova nēbi n'okpuru ákwà-nkwuba. 2 Netan we si Devid, Ihe nile nke di n'obi-gi, me ya; n'ihi na Chineke nọyere gi. 3 O rue, n'abali ahu, na okwu Chineke ruru Netan nti, si, 4 Je, si Devid, bú orùm, Otú a ka Jehova siri, Gi onwe-gi agaghi-ewurum ulo ibu ebe M'gēbi: 5 n'ihi na ebighm n'ulo site n'ubọchi M'mere ka Israel rigota, rue ta; kama esim n'otù ulo-ikwū ba n'ulo-ikwū ọzọ, si kwa n'otù ebe-obibi ba n'ebe-obibi ọzọ. 6 N'ebe nile nke M'nējeghari n'etiti Israel nile, ọ̀ di okwu M'gwara otù nime ndi-ikpe Israel, nke M'nyere iwu izù ndim, si, N'ìhi gini ka unu nēwurughm ulo cedar? 7 Ma ub͕u a otú a ka i gāsi orùm, bú Devid, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Mu onwem siri n'ebe-ita-nri anu-ulo, si kwa n'ebe i nēso ìgwè ewu na aturu, kuru gi, ka i buru onye-ndú ndim, bú Israel: 8 M'we nọyere gi n'ebe ọ bula i jere, ebipu-kwa-ram ndi-iro-gi nile n'iru gi; M'gēme-kwa-ra gi aha, dika aha ndi uku ndi nọ n'uwa. 9 M'gēdo-kwa-ra ndim, bú Israel, otù ebe, ku kwa ha dika osisi, ka ha we biri n'ọnọdu-ha, ghara ima jijiji ọzọ; umu ajọ omume agaghi-eme kwa ha ọzọ ka ha nāka nká ngwa ngwa, dika na mbu, 10 na dika site n'ubọchi mb͕e M'nyere ndi-ikpe iwu ibu ndi-isi ndim, bú Israel: emewokwam ka ndi-iro-gi nile ruru ala. Anamegosi kwa gi na Jehova gēwuru gi ulo. 11 Ọ gēru kwa, mb͕e ubọchi-gi zuru ijeso nna-gi-hà, na M'gēme ka o bilie, bú nkpuru-gi nke gānọchi gi, onye gēsite n'umu-gi ndikom; M'gēme kwa ka ala-eze-ya guzosie ike. 12 Onye ahu gēwurum ulo, M'gēme kwa ka oche-eze-ya guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi. 13 Mu onwem gāburu ya nna, ya onwe-ya gābu-kwa-ram nwa: M'gaghi-ewezuga kwa eberem n'ebe ọ nọ, dika M'wezugara ya n'ebe ọ nọ, bú onye buru gi uzọ: 14 ma M'gēme ka o nēguzo n'ulom na n'ala-ezem rue mb͕e ebighi-ebi: agēme kwa ka oche-eze-ya buru ihe guzosiri ike rue mb͕e ebighi-ebi. 15 Dika okwu ndia nile si di, na dika ọhù a nile si di, otú a ka Netan gwara Devid okwu. 16 Devid, bú eze, we ba, nọdu ala n'iru Jehova; ọ si, Ònye ka m'bu, Jehova, bú Chineke, gini kwa ka ulom bu, na I mewo ka m'biarue na mb͕e a? 17 Ma nka bu ihe ntà n'anya-gi, Chineke; I we kwue okwu bayere ulo orù-Gi rue mb͕e di anya, I huwokwam dika ọnọdu nke madu nọ n'elu si di, Jehova, bú Chineke. 18 Gini ka Devid gāgwa kwa Gi ọzọ bayere nsọpuru orù-Gi? n'ihi na Gi onwe-gi mara orù-Gi. 19 Jehova, n'ihi orù-Gi, na dika obi-Gi si di, ka I meworo ihe-idi-uku a nile, ime ka amara ihe uku ndia nile. 20 Jehova, ọ dighi onye di ka Gi, ọ dighi kwa Chineke ma-ọbughi Gi, dika ihe nile si di nke ayi nuworo na nti-ayi. 21 Ma òle mba di ka ndi-Gi, bú Israel, nke bu otù mba nke nēguzo iche n'uwa, nke Chineke jere ib͕aputara Onwe-ya ibu otù ndi, imere Onwe-gi aha site n'ihe-idi-uku na ihe di egwu, ichupu mba di iche iche n'iru ndi-Gi, ndi I siri n'Ijipt b͕aputa? 22 I we doro Onwe-gi ndi-Gi, bú Israel, ibu otù ndi rue mb͕e ebighi-ebi; Gi onwe-gi, Jehova, we ghọrọ ha Chineke. 23 Ma ub͕u a, Jehova, okwu ahu nke I kwuworo bayere orù-Gi, baye-kwa-ra ulo-ya, ka eme ya ka o guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi, Gi me kwa dika I kwuworo. 24 Ka eme kwa ka ọ buru ihe kwesiri ntukwasi-obi, ka aha-Gi di kwa uku rue mb͕e ebighi-ebi, si, Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke Israel, bu Chineke Israel nwere: agēme kwa ka ulo Devid, bú orù-Gi, guzosie ike n'iru Gi. 25 N'ihi na Gi onwe-gi, Chinekem, ekpughewo nti orù-Gi, si na I gēwuru ya ulo: n'ihi nka orù-Gi nwetara obi-ike ikpe ekpere n'iru Gi. 26 Ma ub͕u a, Jehova, Gi onwe-gi bu Chineke onwe-ya, I gwawo kwa orù-Gi ezi ihe a: 27 ma ub͕u a I kwerewo igọzi ulo orù-Gi, ka o we dirue mb͕e ebighi-ebi n'iru Gi: n'ihi na Gi onwe-gi, Jehova, agọziwo, o we buru ihe agọziri agọzi rue mb͕e ebighi-ebi.

1 Ihe Emere 18

1 O rue, mb͕e nka gasiri, na Devid tib͕uru ndi Filistia, me kwa ka ha ruru ala, o we nara n'aka ndi Filistia Gat na umu-obodo-ya. 2 O tib͕u-kwa-ra Moab; Moab we ghọrọ Devid ndi-orù, nēbute onyinye-inata-iru-ọma. 3 Devid tib͕u-kwa-ra Hedareza, bú eze Zoba, rue Hemat, mb͕e o nēje ime ka ike-ya guzo n'akuku osimiri Yufretis. 4 Devid we napu n'aka-ya nnù ub͕ọ-ala abua na ọgu iri, na nnù ndi-inyinya iri-na-asa na ọgu iri, na orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri, bú ndi ji ukwu eje: Devid bipu-kwa-ra nkwonkwo-ukwu inyinya ub͕ọ-ala nile, ma o kwere ka ọgu inyinya ub͕ọ-ala ise fọdu n'etiti ha. 5 Siria Damaskọs we bia iyere Hedareza, bú eze Zoba, aka, Devid we tib͕ue n'etiti ndi Siria orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri-na-ise. 6 Devid we tiye ebe-nguzo-ndi-agha nime Siria Damaskọs; Siria we ghọrọ Devid ndi-orù, nēbute onyinye-inata-iru-ọma. Jehova we nāzọputa Devid ebe ọ bula o jere. 7 Devid we chiri ọta ọla-edo nke dikwasiri ndi-orù Hedareza, chita ha na Jerusalem. 8 Devid we si na Tibhat, si kwa na Kun, bú obodo Hedareza, chiri ọtutu ọla nke-uku, nke Solomon ji me oké osimiri ọla ahu, na ogidi nile, na ihe ọla nile. 9 Tou, bú eze Hemat, we nu na Devid etib͕uwo usu-ndi-agha nile nke Hedareza, bú eze Zoba; 10 o we zìe Hadoram nwa-ya jekuru eze, bú Devid, iju ya ajuju bayere udo-ya, na igọzi ya, n'ihi na o busoworo Hedareza agha, we tib͕ue ya; n'ihi na nwoke nke nēbuso Tou agha nke-uku ka Hedareza bu; ihe nile nke ọla-edo na nke ọla-ọcha na nke ọla di kwa n'aka Hadoram. 11 Ihe ndia ka eze, bú Devid, do-kwa-ra nsọ nye Jehova, tiyere ọla-ọcha na ọla-edo ahu nke o butere site na mba nile; site n'Edom, site kwa na Moab, site kwa n'umu Amon, site kwa na ndi Filistia, site kwa n'Amalek. 12 Abishai nwa Zeruaia tib͕u-kwa-ra Edom nime Ndagwurugwu Nnù. orú nnù ndikom uzọ abua na nnù ise. 13 O we tiye ebe-nguzo-ndi-agha n'Edom; Edom nile we ghọrọ Devid ndi-orù. Jehova we nāzọputa Devid ebe ọ bula o jere. 14 Devid we buru eze Israel nile; o we nēmere ndi-ya nile ihe ekpere m'ikpe na ezi omume. 15 Joab nwa Zeruaia bu onye-isi usu-ndi-agha; Jehoshafat nwa Ahailud bu onye-ncheta. 16 Zedok nwa Ahaitub, na Abimelek nwa Abaiata, bu ndi-nchu-àjà; Shavsha bu ode-akwukwọ; 17 Benaia nwa Jehoiada bu onye-isi ndi Keret na ndi Pelet; umu-ndikom Devid bu ndi-isi n'aka eze.

1 Ihe Emere 19

1 O rue, mb͕e ihe a gasiri, na Nehash, bú eze umu Amon, nwuru, nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya. 2 Devid we si, M'gēmere Hanun nwa Nehash ebere, n'ihi na nna-ya merem ebere. Devid we ziga ndi-ozi ikasi ya obi bayere nna-ya. Ndi-orù Devid we ba n'ala umu Amon jekuru Hanun, ikasi ya obi. 3 Ma ndi-isi umu Amon siri Hanun, Devid, ọ̀ nāsọpuru nna-gi n'anya-gi, na o ziteworo gi ndi-nkasi-obi? ọ̀ bughi ileputa ala-ayi, na ikwatu ya, na iledo ya, ka ndi-orù-ya biakutere gi? 4 Hanun we were ndi-orù Devid, kọpu ha afu-ọnu, bipu kwa uwe-nwuda-ha n'etiti, rue otule-ha, we zilaga ha. 5 Ewe je gosi Devid ihe bayere ndikom ahu. O we ziga izute ha; n'ihi na ihere nēme ndikom ahu nke-uku. Eze we si, Nọdunu na Jeriko rue mb͕e afu-ọnu-unu tolitere, mb͕e ahu ka unu gālata. 6 Umu Amon we hu na ha emewo onwe-ha ka ha nēsi Devid ísì ọjọ, Hanun na umu Amon we ziga nnù talent ọla-ọcha abua na ọgu iri igotara onwe-ha ub͕ọ-ala na ndi-inyinya site na Mesọpọtemia, site kwa na Siria Meaka, site kwa na Zoba. 7 Ha we gotara onwe-ha orú nnù ub͕ọ-ala uzọ anọ, na eze Meaka na ndi-ya; ha we bia ma ulo-ikwū-ha n'iru Medeba. Umu Amon si-kwa-ra n'obodo nile ha chikọta onwe-ha, bia ibu agha. 8 Devid we nu ya, ziga Joab, na usu-ndi-agha nile, bú ndi-dike. 9 Umu Amon we puta, do agha n'usoro n'ọnu-uzọ obodo: ma ndi-eze ndi biara nọrọ onwe-ha n'ọhia. 10 Joab we hu na iru agha ahu di megide ya iru na azu, o we rọputa ufọdu n'etiti ndi Israel nile arọputara arọputa, do ha n'usoro izute Siria. 11 O tiye ndi Israel fọduru n'aka Abishai, bú nwa-nne-ya, ha we do onwe-ha n'usoro izute umu Amon. 12 Ọ si, Ọ buru na Siria akariam ike, i gābu-kwa-ram onye-nzọputa: ma ọ buru na umu Amon akaria gi ike, m'gāzọputa kwa gi. 13 Di ike, ka ayi me kwa onwe-ayi ndi di ike n'ihi ndi-ayi, na n'ihi obodo nile nke Chineke-ayi: Jehova me kwa ihe di nma n'anya-Ya. 14 Joab na ndi soro ya we biarue nso n'iru ndi Siria ibu agha; ha we b͕alaga n'iru ya. 15 Umu Amon we hu na Siria ab͕alagawo, ha onwe-ha we b͕alaga kwa n'iru Abishai nwa-nne-ya, ba n'obodo. Joab we biarue Jerusalem. 16 Siria we hu na etib͕uru ha n'iru Israel, ha we ziga ndi-ozi, me ka Siria ndi nọ n'ofè Osimiri puta, Shofak onye-isi usu-ndi-agha Hedareza je-kwa-ra n'iru ha. 17 Ewe gosi Devid; o we chikọta Israel nile, gabiga Jọdan, biakute ha, do agha n'usoro megide ha. Devid we do ndi-ya n'usoro izute Siria, ha we buso ya agha. 18 Siria we b͕alaga n'iru Israel; Devid we b͕ue n'etiti ndi Siria ndikom nke nnù ub͕ọ-ala iri-na-asa na ọgu iri, na orú nnù ndikom uzọ ise, bú ndi ji ukwu eje, o me-kwa-ra ka Shofak, bú onye-isi usu-ndi-agha-ha, nwua. 19 Ndi-orù Hedareza we hu na etib͕uru ha n'iru Israel, ha we me ka ha onwe-ha na Devid di n'udo, we fè ya òfùfè: Siria ekweghi kwa izọputa umu Amon ọzọ.

1 Ihe Emere 20

1 O rue, na mb͕e ọb͕ub͕a arọ, na mb͕e ndi-eze nāpu ibu agha, na Joab dupuru ndi-dìnkpà nke usu-ndi-agha, bibie ala umu Amon, bia, nọchigide Raba n'agha. Ma Devid nānọdu na Jerusalem. Joab we tib͕ue Raba, kwada kwa ya. 2 Devid we kpupu okpu-eze nke eze-ha n'isi-ya, we hu na o ruru otù talent ọla-edo n'ọtùtù, nkume di okè ọnu-ahia di kwa nime ya; o we di n'isi Devid: o weputa-kwa-ra ihe-nkwata obodo ahu, nke riri nne nke-uku. 3 O me-kwa-ra ka ndi nọ nime ya puta, o do ha n'okpuru mma-nkwọ, na n'okpuru ígwè nēbì ihe, na n'okpuru anyu-ike. Otù a ka Devid nēme kwa obodo nile nke umu Amon. Devid na ndi Israel nile we lata na Jerusalem. 4 O rue, mb͕e ihe a gasiri, na agha biliri na Gezea nke ebusoro ndi Filistia: mb͕e ahu Sibekai onye Husha tib͕uru Sipai, nke sitere n'umu Rafa: ewe me ka ha ruru ala. 5 Agha we di ọzọ ebusoro ndi Filistia; Elhanam nwa Jaia we tib͕ue Lahmi, bú nwa-nne Gọlaiat onye Gat, onye osisi ube-ya di ka oké ókpòrò di arọ́ nke ọkpa-ákwà ji akpa ákwà. 6 Agha we di ọzọ na Gat, ma otù nwoke toro ogologo nọ n'ebe ahu, nkpisi aka-ya abua di isi isi, nkpisi ukwu-ya abua di kwa isi isi, ha nile di orú na anọ; ma amu-kwa-ra onye ahu nye Rafa. 7 Ọ ta Israel uta, Jonatan nwa Shimea, bú nwa-nne Devid, we tib͕ue ya. 8 Ndia ka amuru nye Rafa nime Gat; ha we da site n'aka Devid, na site n'aka ndi-orù-ya.

1 Ihe Emere 21

1 Setan we guzo imegide Israel, o we kpalie Devid iguta Israel. 2 Devid we si Joab, si kwa ndi-isi ndi Israel, Jenu, gua Israel ọnu site na Bia-sheba we rue Dan; wetaranum ọnu-ọgugu-ha ka m'we mara ya. 3 Joab we si, Ka Jehova tukwasiri ndi-Ya, ka iba-uba ha bara ra, otù onye ọgu ise otù onye ọgu ise: onye-nwem, bú eze, hà abughi ndi-orù onye-nwem nwere, ha nile? n'ìhi gini ka onye-nwem nāchọ ihe a? n'ìhi gini ka ọ gāghọrọ Israel ihe-ikpe-ọmuma? 4 Ma okwu eze di ike n'ebe Joab nọ. Joab we pua, jegharia n'Israel nile, biarue Jerusalem. 5 Joab we nye Devid ọnu-ọgugu nke ngukọta ọ gukọtara ndi Israel. Israel nile we di orú nnù ndikom ọgu uzọ isi na uzọ iri-na-asa na nnù iri, ndi nāmiputa mma-agha: Juda di kwa orú nnù ndikom ọgu uzọ abua na uzọ iri-na-asatọ na nnù iri-na-ise, ndi nāmiputa mma-agha. 6 Ma ọ gukọtaghi Livai na Benjamin n'etiti ha: n'ihi na okwu eze bu ihe-árú n'anya Joab. 7 Ọ we jọ njọ n'anya Chineke bayere okwu a, O we tib͕ue Israel. 8 Devid we si Chineke, Emehiewom nke-uku n'ihe a m'meworo: ma ub͕u a, biko, me ka ajọ omume orù-Gi gabiga; n'ihi na emewom ihe-nzuzu nke-uku. 9 Jehova we gwa Gad, bú onye-ọhu-uzọ nke Devid, okwu, si, 10 Je gwa Devid okwu, si, Otú a ka Jehova siri, Ihe atọ ka Mu onwem nēche n'iru gi; rọputara onwe-gi otù nime ha, ka M'we me gi ya. 11 Gad we biakute Devid, si ya, Otú a ka Jehova siri, Nara n'onwe-gi otù n'ihe ndia; 12 ma ọ bu oké unwu arọ atọ; ma-ọbu ka ekpochapu gi ọnwa atọ n'iru ndi nākpab͕u gi, ọbuná mma-agha ndi-iro-gi nēru gi aru; ma-ọbu mma-agha Jehova ubọchi atọ, bú ajọ ọria nēfe efe n'ala, mọ-ozi nke Jehova nēbibi kwa n'ókè-ala nile nke Israel. Ma ub͕u a le okwu m'gēweghachiri Onye nēzitem. 13 Devid we si Gad, Anọm na nkpà nke-uku: biko ka m'dabà n'aka Jehova; n'ihi na obi-ebere-Ya bara uba nke-uku: ma ka m'ghara idabà n'aka madu. 14 Jehova we tiye ajọ ọria nēfe efe n'aru Israel: orú nnù ndikom uzọ asatọ na nnù iri-na-ise we dapu n'Israel. 15 Chineke we ziga mọ-ozi na Jerusalem ibibi ya: ma mb͕e ọ gaje ibibi, Jehova huru, we chègharia n'ihe ọjọ ahu, we si mọ-ozi ahu nke nēbibi, O zuwo; ub͕u a ra aka-gi. Ma mọ-ozi nke Jehova nēguzo n'akuku ebe-nzọcha-ọka nke Ọnan onye Jebus. 16 Devid we welie anya-ya, hu mọ-ozi nke Jehova, ka o nēguzo n'etiti ala na elu-igwe, ya na mma-agha-ya amiputara amiputa n'aka-ya, nke esetiri n'elu Jerusalem. Devid na ndi-okenye we kpuru ákwà-nkpe da kpuchie iru-ha n'ala. 17 Devid we si Chineke, Ọ̀ bughi mu onwem siri ka aguta ndi Israel? ọbuná mu onwem ka ọ bu, bú onye mehieworo, me kwa ihe ọjọ nke-uku; ma ìgwè aturu ndia, gini ka ha mere? biko, Jehova, bú Chinekem, ka aka-Gi digidem, digide kwa ulo nnam; ma ka ọ ghara idigide ndi-Gi, ka etie ha ihe-otiti. 18 Mọ-ozi nke Jehova we si Gad ka ọ si Devid ka Devid rigo, me ka ebe-ichu-àjà guzoro Jehova n'ebe-nzọcha-ọka nke Ọnan onye Jebus. 19 Devid we rigo n'okwu Gad nke o kwuru n'aha Jehova. 20 Ọnan we chigharia, hu mọ-ozi ahu; umu-ya ndikom anọ ndi ya na ha nọ we nēzo onwe-ha. Ma Ọnan nāzọcha ọka wheat. 21 Devid we biakute Ọnan, Ọnan we legide anya, hu Devid, si n'ebe-nzọcha-ọka-ya puta, kpọ isi ala nye Devid, kpuchie iru-ya n'ala. 22 Devid we si Ọnan, Nyem ebe a, bú ebe-nzọcha-ọka nka, ka m'we wuere Jehova ebe-ichu-àjà nime ya: n'ego zuru ezu o ruru ka i gēnyem ya: ka ewe b͕ochie ihe-otiti a n'ebe ndi Israel nọ. 23 Ọnan we si Devid, Were ya n'onwe-gi, ka onye-nwem, bú eze, me kwa ihe di nma n'anya-ya: le, enyewom gi ehi iji chu àjà-nsure-ọku, na ihe nzọcha-ọka ka ha buru nkú, na ọka wheat ka ọ buru onyinye-inata-iru-ọma; ihe nile ka m'nyeworo. 24 Eze, bú Devid, we si Ọnan, É-è; kama aghaghm izuru ya n'ego zuru ezu o ruru: n'ihi na m'gaghi-ewere ihe i nwere ichuru Jehova àjà, m'gaghi-esure kwa àjà-nsure-ọku nke m'nētiyeghi ego ọ bula. 25 Devid we nye Ọnan nnù shekel ọla-edo na ọgu iri n'ọtùtù iji zuru ebe ahu. 26 Devid we wuere Jehova ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, sure àjà-nsure-ọku na àjà-udo, kpọkue Jehova; Ọ we were ọku si n'elu-igwe za ya n'elu ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku. 27 Jehova we gwa mọ-ozi ahu; o we mighachi mma-agha-ya n'ọbọ-ya. 28 Na mb͕e ahu, mb͕e Devid huru na Jehova zara ya n'ebe-nzọcha-ọka nke Ọnan onye Jebus, o we chua àjà n'ebe ahu. 29 Ma ebe-obibi Jehova, nke Moses mere n'ọzara, na ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku, di n'ebe di elu nime Gibeon na mb͕e ahu. 30 Ma Devid apughi ije n'iru ya iju Chineke ase: n'ihi na ọ turu egwu nke-uku n'ihi mma-agha mọ-ozi nke Jehova.

1 Ihe Emere 22

1 Devid we si, Nka bu ulo Jehova, bú Chineke, nka bu-kwa-ra Israel ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku. 2 Devid we si ka achikọta ndi-ọbìa ndi nọ n'ala Israel; o we guzo ndi nāwa nkume iwa nkume awaputara awaputa iwu ulo Chineke. 3 Devid dozi-kwa-ra ígwè riri nne ikpuru ibo ọnu-uzọ-ama nile ǹtú, na ikpu ihe-njikọta nile; na ọla riri nne nke anātùghi atù; 4 na osisi cedar nādighi ọnu-ọgugu: n'ihi na ndi Zaidon na ndi Taia butere osisi cedar riri nne nye Devid. 5 Devid we si, Solomon nwam bu nwata di kwa nrò, ma ulo ahu agēwuru Jehova, aghaghi ime ya ka ọ di uku kachasi ulo nile, ibu aha na ibu ihe mara nma diri ala nile: biko, ka m'doziere ya. Devid we dozie ri nne tutu ọ nwua. 6 O we kpọ Solomon, bú nwa-ya, nye ya iwu iwuru Jehova, bú Chineke Israel, ulo. 7 Devid we si Solomon nwa-ya, Mu onwem, ọ di n'obim iwuru aha Jehova, bú Chinekem, ulo. 8 Okwu Jehova we ruem nti, si, I wusiwo ọbara ri nne, i buwo kwa agha uku di iche iche: i gaghi-ewuru aham ulo, n'ihi na i wusiwo ọtutu ọbara n'uwa n'irum: 9 le, agāmuru gi nwa-nwoke, onye ahu gābu nwoke izu-ike; M'gēme kwa ka o zuru ike pua n'aka ndi-iro-ya nile buruburu: n'ihi na Solomon ka aha-ya gābu, M'gēnye kwa Israel udo na idi-jū n'ubọchi-ya: 10 onye ahu gēwuru aham ulo; ya onwe-ya gāburum nwa, Mu onwem gābu-kwa-ra ya nna; M'gēme kwa ka oche-eze nke ala-eze-ya guzosie ike n'elu Israel rue mb͕e ebighi-ebi. 11 Ub͕u a, nwam, ka Jehova nọyere gi; gi nwe kwa uche, wue ulo Jehova, bú Chineke-gi, dika O kwuworo bayere gi. 12 Nání Jehova nye gi ezi uche na nghọta, nye gi iwu bayere Israel; ọbuná idebe iwu Jehova, bú Chineke-gi. 13 Mb͕e ahu ka i gēnwe uche, ọ buru na i lezie anya ime ukpuru nile na ikpé nile nke Jehova nyere Moses n'iwu bayere Israel: di ike, nwe kwa ume; atula egwu, atu-kwa-la ujọ. 14 Ma, le, na nwedam edoziworom ulo Jehova ọla-edo orú nnù talent uzọ iri-na-abua na nnù iri, na ọla-ọcha orú nnù talent ọgu uzọ isi na uzọ ise; ma ọla na ígwè enweghi ọtùtù; n'ihi na o riri nne: edoziwokwam osisi na nkume; i gātukwasi kwa ha ihe. 15 Ndi nēje ozi ri-kwa-ra nne n'aka-gi, ndi nāwa nkume na osisi na ndi-ọ̀kà nkume na osisi, na ndi nile mara ihe n'ije-ozi ọ bula; 16 ọla-edo, na ọla-ọcha, na ọla, na ígwè, enweghi ọnu-ogugu; bilie, lua ọlu, ka Jehova nọyere kwa gi. 17 Devid we nye ndi-isi nile nke Israel iwu iyere Solomon nwa-ya aka, si, 18 Jehova, bú Chineke-unu, Ọ̀ nọyeghi unu? Ọ̀ meghi kwa ka unu zuru ike buruburu? n'ihi na Ọ nyewo n'akam ndi bi n'ala; ebudawo kwa ala n'iru Jehova, na n'iru ndi-Ya. 19 Ub͕u a werenu obi-unu na nkpuru-obi-unu nye ichọ Jehova, bú Chineke-unu; bili-kwa-nu, wue ebe nsọ Jehova, bú Chineke, ibubata ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, na ihe nsọ nile nke Chineke, n'ulo nke anēwuru aha Jehova.

1 Ihe Emere 23

1 Ma Devid ghọrọ agadi, ubọchi ndu-ya ju-kwa-ra ya afọ, o we me Solomon, bú nwa-ya, eze Israel. 2 O we chikọta ndi-isi nile nke Israel, ha na ndi-nchu-àjà na ndi Livai. 3 Ewe gua ndi Livai ọnu site n'onye b͕ara orú arọ na iri we gaba n'iru: ọnu-ọgugu-ha, onye na isi-ya onye na isi-ya, ndikom di ike, di orú nnù uzọ anọ na nnù iri-na-ise. 4 Nime ndia ndi ọlu-ha bu ichi achi n'ije-ozi ulo Jehova di orú nnù uzọ atọ; nnù ndikom iri-na-ise bu ndi-odozi-okwu na ndi-ikpe: 5 nnù ndikom iri bu ndi-ọnu-uzọ; nnù ndikom iri nēto Jehova n'ihe m'mere iji to Ya, ka Devid kwuru. 6 Devid we kè ha n'òkè, n'òkè, dika umu Livai si di; bú Giashon na Kohat, na Merari. 7 Nke ndi Giashon; Ladan na Shimai. 8 Umu-ndikom Ladan; onye-isi bu Jehiel, na Zitam, na Joel, atọ. 9 Umu-ndikom Shimai; Shel-omot, na Haziel, na Haran, atọ. Ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna umu Ladan. 10 Umu-ndikom Shimai kwa; Jahat, na Zina, na Jeush, na Beria. Anọ ndia bu umu Shimai. 11 Jahat bu onye-isi, Ziza bu kwa nke-abua: ma Jeush na Beria enweghi ọtutu umu-ndikom; ha we ghọ otù ulo nna site n'igukọta ha n'otù. 12 Umu-ndikom Kohat; Amram, na Izha, na Hebron, na Uziel, anọ. 13 Umu-ndikom Amram; Eron na Moses: ewe kewapu Eron, ido ya nsọ ibu onye nsọ kachasi ndi nsọ nile, ya onwe-ya na umu-ya ndikom, rue mb͕e ebighi-ebi, isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'iru Jehova, ijere Ya ozi, na igọzi n'aha-Ya, rue mb͕e ebighi-ebi. 14 Ma Moses, bú onye nke Chineke ahu, anākpọ umu-ya ndikom aha n'etiti ebo Livai. 15 Umu-ndikom Moses; Giashom, na Elieza. 16 Umu-ndikom Giashon; Shebuel, bú onye-isi. 17 Umu-ndikom Elieza bu kwa Rehabia, bú onye-isi. Ma Elieza enweghi umu-ndikom ọzọ; ma umu-ndikom Rehabia bara uba nke-uku. 18 Umu-ndikom Izha; Shelomit, bú onye-isi. 19 Umu-ndikom Hebron; Jeria, bú onye-isi, na Amaraia, bú nke-abua, na Jehaziel, bú nke-atọ, na Jekameam, bú nke-anọ. 20 Umu-ndikom Uziel; Maika, bú onye-isi, na Ishia, bú nke-abua. 21 Umu-ndikom Merari; Mahli na Mushi. Umu-ndikom Mahli; Eleeza na Kish. 22 Eleeza we nwua, ma o nweghi umu-ndikom, ọ bu nání umu-ndinyom: umu-nne-ha, bú umu-ndikom Kish, we luru ha na nwunye. 23 Umu-ndikom Mushi; Mahli, na Ida, na Jeremot, atọ. 24 Ndia bu umu Livai dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi-ha agukọtara, n'ọnu-ọgugu aha, onye na isi-ya onye na isi-ya, ndi nēje ozi ahu diri òfùfè ulo Jehova, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba. 25 N'ihi na Devid siri, Jehova, bú Chineke Israel, emewo ka ndi-Ya zuru ike; Ọ nēbi kwa nime Jerusalem rue mb͕e ebighi-ebi: 26 ọzọ kwa, ndi Livai agaghi-enwe ibūru ebe-obibi na ihe-ya nile diri òfùfè-ya. 27 N'ihi na n'okwu ikpe-azu Devid ka edere ndia, bú ọnu-ọgugu umu-ndikom Livai site n'onye b͕ara orú arọ we gaba. 28 N'ihi na ebe-nguzo-ha di n'akuku umu Eron ifè òfùfè ulo Jehova, n'ogige nile, na n'ime-ulo nile, na n'ime ka ihe nsọ ọ bula di ọcha, bú ọlu òfùfè ulo Chineke; 29 na idozi achicha anēdo n'usoro, na idozi utu oka flour iji nye onyinye-inata-iru-ọma, na idozi mbadamba-achicha ekoghi-eko, na idozi ihe esiri n'ite isi ihe, na idozi ihe edere edè, na idebe ihe ọ bula itù ihe di miri miri na ihe ọ bula itù ihe ọzọ; 30 na iguzo kwa-ututu ikele na ito Jehova, otú a kwa n'anyasi; 31 na isurere Jehova àjà-nsure-ọku nile, n'ubọchi-izu-ike nile, na n'ọnwa ọhu nile, na nime mb͕e nile akara àkà, n'ọnu-ọgugu dika ikpe ekpere ha si di, mb͕e nile n'iru Jehova: 32 ka ha we debe kwa ihe-ndebe ulo-ikwū nzute, na ihe-ndebe ebe nsọ ahu, na ihe-ndebe umu Eron, bú umu-nne-ha, bayere òfùfè ulo Jehova.

1 Ihe Emere 24

1 Ekè-kwa-ra umu Eron òkè nile ha. Umu-ndikom Eron; Nedab, na Abaihu, na Eleeza, na Itama. 2 Nedab na Abaihu we nwua n'iru nna-ha, ha enweghi kwa umu-ndikom: Eleeza na Itama we buru ndi-nchu-àjà. 3 Devid we kè ha, ya na Zedok, onye sitere n'umu Eleeza, na Ahimelek, sitere n'umu Itama, dika ihe-nlekọta-ha si di n'òfùfè-ha. 4 Ewe chọta ọtutu umu Eleeza ibu ndi-isi nke ndikom di ike kari umu Itama; ewe kè ha otú a: umu Eleeza nwere ndi-isi ulo nke ndi bu nna iri na isi; umu Itama nwe-kwa-ra asatọ, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di. 5 Ewe kè ha n'ife-nzà, ndi Eleeza na ndi Itama n'otù; n'ihi na ndi-isi ebe nsọ di, na ndi-isi nke Chineke, ndi sitere n'umu Eleeza na n'etiti umu Itama. 6 Shemaia nwa Netanel, bú ode-akwukwọ, onye sitere na ndi Livai, we de ha n'akwukwọ n'iru eze, na ndi-isi, na Zedok, bú onye-nchu-àjà, na Ahimelek nwa Abaiata, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi-nchu-àjà na nke ndi Livai: otù ulo nna nke Eleeza ka ejidere, ejide-kwa-ra otù nke Itama. 7 Ife-nzà mbu we putara Jehoiarib, nke-abua putara Jedaia; 8 nke-atọ putara Harim, nke-anọ putara Seorim; 9 nke-ise putara Malkija, nke-isi putara Mijamin; 10 nke-asa putara Hakoz, nke-asatọ putara Abaija; 11 nke-iteghete putara Jeshua, nke-iri putara Shekania; 12 nke-iri-na-otù putara Elaiashib, nke-iri-na-abua putara Jakim; 13 nke-iri-na-atọ putara Hupa, nke-iri-na-anọ putara Jeshebeab; 14 nke iri-na-ise putara Bilga, nke-iri-na-isi putara Imea; 15 nke-iri-na-asa putara Hezia, nke-iri-na-asatọ putara Hapizez; 16 nke-iri-na-iteghete putara Petahia, nke-orú putara Jehezkel; 17 nke-orú-na-otù putara Jakin, nke-orú-na-abua putara Gamul; 18 nke-orú-na-atọ putara Delaia, nke-orú-na-anọ putara Maazia. 19 Ndia bu ihe-nlekọta-ha ifè òfùfè-ha, ibà n'ulo Jehova, dika ikpé-ha si di site n'aka Eron nna-ha, dika Jehova, bú Chineke Israel, nyere ya iwu. 20 Ma nke umu Livai ndi fọduru: nke umu Amram, Shubael; nke umu Shubael, Jehdeia. 21 Nke Rehabia: nke umu Rehabia, onye-isi bu Ishia. 22 Nke ndi Izha, Shelomot; nke umu Shelomot, Jahat. 23 Umu-ndikom Hebron kwa; Jeria, bú onye-isi, na Amaraia, bú nke-abua, na Jehaziel, bú nke-atọ, na Jekameam, bú nke-anọ. 24 Umu-ndikom Uziel, Maika; nke umu-ndikom Maika, Shamia. 25 Nwa-nne Maika, Ishia: nke umu-ndikom Ishia, Zekaraia. 26 Umu-ndikom Merari; Mahli na Mushi: umu-ndikom Jaazia; Beno. 27 Umu-ndikom Merari; nke Jaazia, Beno, na Shoham, na Zakua, na Ibri. 28 Nke Mahli; Eleeza, onye nēnweghi umu-ndikom. 29 Nke Kish; umu-ndikom Kish, Jerahmeel. 30 Umu-ndikom Mushi kwa; Mahli, na Ida, na Jerimot. Ndia bu umu ndi Livai, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di. 31 Ndia fe-kwa-ra nzà, ọbuná dika umu-nne-ha, bú umu Eron, fere, n'iru Devid, bú eze, na Zedok, na Ahimelek, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi-nchu-àjà na nke ndi Livai; ulo nke ndi bu nna nke onye-isi ọbuná dika nke nwa-nne-ya nke-ntà.

1 Ihe Emere 25

1 Devid na ndi-isi usu-ndi-agha we kewaputara òfùfè ufọdu nime umu Esaf, na nke Himan, na nke Jedutun, ndi nēwere ubọ-akwara, na une, na ájà, bu amuma: ọnu-ọgugu-ha, bú ndikom nēje ozi dika òfùfè-ha si di, we di: 2 nke umu ndikom Esaf; Zakua, na Josef, na Netanaia, na Asharela, bú umu Esaf; ha nọ n'aka Esaf, onye nēbu amuma n'aka eze. 3 Nke Jedutun: umu-ndikom Jedutun; Gedalaia, na Zeri, na Jeshaia, na Hashabaia, na Matitaia, isi; ha nọ n'aka nna-ha, bú Jedutun, onye nēwere ubọ-akwara bu amuma bayere ikele na ito Jehova. 4 Nke Himan: umu-ndikom Himan; Bukia, na Matanaia, na Uziel, na Shebuel, na Jerimot, na Hananaia, na Hanani, na Eliata, na Gidalti, na Romamti-eza, na Joshbekasha, na Maloti, na Hotia, na Mahaziot: 5 ndia nile bu umu-ndikom Himan, bú onye-ọhu-uzọ eze n'okwu Chineke, iweli mpi elu. Chineke we nye Himan umu-ndikom iri na anọ na umu-ndinyom atọ. 6 Ndia nile nọ n'aka nna-ha n'ibù abù n'ulo Jehova, chiri ájà, na une, na ubọ-akwara, iji fè òfùfè nke ulo Chineke; ha nọ n'aka eze, bú Esaf, na Jedutun, na Himan. 7 Ọnu-ọgugu-ha, tiyere umu-nne-ha, ndi ezíworo abù anābùku Jehova, bú ndi nile nwere nghọta, di ọgu iri-na-anọ na asatọ. 8 Ha we fe nzà bayere ihe-ndebe-ha, ha nile n'otù aka ahu, ma onye ntà ma onye uku, onye nwere nghọta tiyere onye anēzí ihe. 9 Ife-nzà mbu nke putara Esaf mara Josef: nke-abua mara Gedalia; ya onwe-ya na umu-nne-ya na umu-ya ndikom di iri na abua: 10 nke-atọ mara Zakua, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua: 11 nke anọ mara Izri, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua: 12 nke-ise mara Netanaia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua: 13 nke-isi mara Bukia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua: 14 nke-asa mara Jesharela, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua: 15 nke-asatọ mara Jeshaia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua: 16 nke-iteghete mara Matanaia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua: 17 nke-iri mara Shimai, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua: 18 nke-iri-na-otù mara Azarel, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua: 19 nke-iri-na-abua mara Hashabaia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua: 20 n'ife-nzà nke-iri-na-atọ ọ mara Shubael, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua: 21 nime nke-iri-na-anọ ọ mara Matitaia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua: 22 nime nke-iri-na-ise ọ mara Jeremot, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua: 23 nime nke-iri-na-isi ọ mara Hananaia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua: 24 nime nke-iri-na-asa ọ mara Joshbekasha, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua: 25 nime nke-iri-na-asatọ ọ mara Hanani, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua: 26 nime nke-iri-na-iteghete ọ mara Maloti, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri-na-abua: 27 nime nke-orú ọ mara Eliata, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua: 28 nime nke-orú-na-otù ọ mara Hotia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua: 29 nime nke-orú-na-abua ọ mara Gidalti, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua: 30 nime nke-orú-na-atọ ọ mara Mahaziot, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua: 31 nime nke-orú-na-anọ ọ mara Romamti-eza, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua.

1 Ihe Emere 26

1 Bayere òkè nile nke ndi-ọnu-uzọ: nke ndi Kora; Meshelemaia nwa Kore, nke sitere n'umu Esaf. 2 Meshelemaia nwe-kwa-ra umu-ndikom; Zekaraia, bú ọkpara, na Jediael, bú nke-abua, na Zebadaia, bú nke-atọ, na Jatniel, bú nke-anọ; 3 na Ilam, bú nke-ise, na Jehohanam, bú nke-isi, na Eliehoenai, bú nke-asa. 4 Obed-edom nwe-kwa-ra umu-ndikom, Shemaia, bú ọkpara, na Jehozabad, bú nke-abua, na Joa, bú nke-atọ, na Saka, bú nke-anọ, na Netanel, bú nke-ise; 5 na Amiel, bú nke-isi, na Isaka, bú nke-asa, na Peuletai, bú nke-asatọ: n'ihi na Chineke gọziri ya. 6 Amu-kwa-ra umu-ndikom nye Shemaia nwa-ya, ndi nāchi ulo nna-ha: n'ihi na ndi-dike bu dìnkpà ka ha bu. 7 Umu-ndikom Shemaia; Ọtni, na Refael, na Obed, na Elzabad, umu-nne-ya bu ndi-dìnkpà, Elaihu, na Semakaia. 8 Ndia nile sitere n'umu Obed-edom: ha onwe-ha na umu-ha ndikom na umu-nne-ha, ndikom bu dìnkpà n'ike ifè òfùfè; ọgu ndikom atọ na abua nke Obed-edom nwere. 9 Meshelemaia nwe-kwa-ra umu-ndikom na umu-nne, ndi-dìnkpà, iri na asatọ. 10 Hosa, onye sitere n'umu Merari, nwe-kwa-ra umu-ndikom; Shimri bú onye-isi, (n'ihi na ọ bu ezie na ọ bughi ọkpara, ma nna-ya mere ya onye-isi; ) 11 na Hilkaia, bú nke-abua, na Tebalia, bú nke-atọ, na Zekaraia, bú nke-anọ: umu-ndikom na umu-nne nile nke Hosa nwere di iri na atọ. 12 Nke ndia ka òkè nile nke ndi-ọnu-uzọ-ama bu, bú nke ndi-isi nke ndi di ike nwere ihe-ndebe ọbuná dika umu-nne-ha, ije ozi n'ulo Jehova. 13 Ha we fe nzà, ma onye ntà ma onye uku, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, bayere ọnu-uzọ-ama ọ bula. 14 Ife-nzà n'akuku ọwuwa-anyanwu we ma Shelemaia. Ha fe-kwa-ra nzà bayere Zekaraia nwa-ya, bú onye nādu ọdu nke nwere uche; ife-nzà-ya we puta n'akuku Ugwu. 15 Ife-nzà nke Obed-edom putara n'akuku Ndida; nke umu-ya ndikom puta-kwa-ra n'ulo nchikọta-ihe. 16 Nke Shupim na nke Hosa putara n'Ọdida-anyanwu, n'akuku ọnu-uzọ-ama Shaleket, n'uzọ atuliri atuli nke nārigo, otù ihe-ndebe nēcherita ihe-ndebe ọzọ iru. 17 Ndi Livai isi nọ n'akuku ọwuwa-anyanwu, n'akuku Ugwu ha di anọ kwa-ubọchi, n'akuku Ndida ha di anọ kwa-ubọchi, ha di-kwa-ra ulo nchikọbata-ihe abua abua kwa-ubọchi. 18 N'èzí ulo n'akuku Ọdida-anyanwu ha di anọ n'uzọ atuliri atuli, abua n'èzí ulo. 19 Ndia bu òkè ndi-ọnu-uzọ-ama; nke umu ndi Kora, na nke umu Merari. 20 Nime ndi Livai, Ahaija bu onye-isi ulo-àkù nile nke ulo Chineke, ọbuná idebe ulo-àkù nile nke ihe nsọ nile. 21 Umu-ndikom Ladan; umu ndi Giashon, bú ndi Ladan nwere, ndi-isi ulo nke ndi bu nna ndi Ladan onye Giashon nwere; Jehieli. 22 Umu-ndikom Jehieli; Zitam, na Joel nwa-nne-ya, bú ndi-isi ulo-àkù nile nke ulo Jehova. 23 Nke ndi Amram, nke ndi Izha, nke ndi Hebron, nke ndi Uziel: 24 Shebuel nwa Giashon, nwa Moses, bu kwa onye-isi ulo-àkù nile. 25 Umu-nne-ya kwa; bú umu nke Elieza: Rehabaia nwa-ya, na Jeshaia nwa-ya, na Joram nwa-ya, na Zikri nwa-ya, na Shelomot nwa-ya. 26 Shelomot nka na umu-nne-ya bu ndi-isi ulo-àkù nile nke ihe nsọ nile nke Devid, bú eze, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna, bú ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri na usu ọgu ndikom ise, na ndi-isi usu-ndi-agha, doro nsọ. 27 Site n'agha-ha nile, bú site n'ihe-nkwata, ka ha doro ya nsọ ime ka ulo Jehova di ike. 28 Ya na ihe nile Samuel, bú onye-ọhu-uzọ, na Sọl nwa Kish, na Abnea nwa Nea, na Joab nwa Zeruaia, doro nsọ; onye ọ bula nke doro ihe nsọ, ọ di n'aka Shelomit na umu-nne-ya. 29 Nke ndi Izha, Kenania na umu-ya ndikom diri ozi èzí n'ebe Israel nọ, ibu ndi-odozi-okwu na ibu ndi-ikpe. 30 Nke ndi Hebron, Hashabaia na umu-nne-ya, bú ndi-dìnkpà, nnù ndikom anọ na ọgu ise, bu ndi-isi nlekọta Israel n'ofè Jọdan n'akuku Ọdida-anyanwu; bayere ozi nile nke Jehova, baye-kwa-ra òfùfè eze. 31 Nke ndi Hebron, Jerija bu onye-isi, ọbuná nke ndi Hebron, dika osuso-ọmumu nile ha si di n'ulo nke ndi bu nna. N'arọ nke-ọgu-abua Devid bu eze ka achọrọ ha, ewe chọta nime ha ndi-dike bu dìnkpà nime Jeza Gilead. 32 Ma umu-nne-ya, bú ndi-dìnkpà, di nnù ndikom isi na ọgu iri-na-ise, ndi-isi ulo nke ndi bu nna; Devid, bú eze, we me ka ha buru ndi-nlekọta ndi Reuben na ndi Gad na nkera ebo ndi Manase, bayere ihe nile nke Chineke na ihe nile nke eze.

1 Ihe Emere 27

1 Ma umu Israel, dika ọnu-ọgugu-ha si di, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha na ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri na usu nile nke ọgu ndikom ise, na ndi-odozi-okwu-ha ndi nējere eze ozi, n'ihe ọ bula nke òkè nile ndi nābata nāpu kwa n'ọnwa n'ọnwa, n'ọnwa nile nke arọ, otù òkè di orú nnù uzọ atọ. 2 Onye-isi òkè mbu nke diri ọnwa mbu bu Jashọbeam nwa Zabdiel: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya. 3 O sitere n'umu Perez, bú onye-isi nke ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha nke diri ọnwa mbu. 4 Ma onye-isi òkè nke ọnwa nke-abua bu Dodai onye Ahoa, na òkè-ya; Miklot bu kwa onye-ndú-ha: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya. 5 Onye-isi usu-ndi-agha nke-atọ nke diri ọnwa nke-atọ bu Benaia nwa Jehoiada onye-nchu-aja, ọ bu onye-isi: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya. 6 Onye ahu bu Benaia nke bu dike nke orú ndikom na iri ahu, ọ bu kwa onye-isi orú na iri ahu: Amizabad nwa-ya di kwa n'òkè-ya. 7 Onye-isi nke-anọ nke diri ọnwa nke-anọ bu Asahel nwa-nne Joab, Zebadaia nwa-ya so-kwa-ra ya: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya. 8 Onye-isi nke-ise nke diri ọnwa nke-ise bu Shamhut onye-Izrahait: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya. 9 Onye-isi nke-isi nke diri ọnwa nke-isi bu Ira nwa Ikesh onye Tekoa: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya. 10 Onye-isi nke-asa nke diri ọnwa nke-asa bu Hilez onye-Pelonait, onye sitere n'umu Efraim: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya. 11 Onye-isi nke-asatọ nke diri ọnwa nke-asatọ bu Sibekai onye Husha, nke ndi Zera: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya. 12 Onye-isi nke-iteghete nke diri ọnwa nke-iteghete bu Abieza onye Anatot, nke ndi Benjamin: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya. 13 Onye-isi nke-iri nke diri ọnwa nke-iri bu Maharai onye Netofa, nke ndi Zera: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya. 14 Onye-isi nke-iri-na-otù nke diri ọnwa nke-iri-na-otù bu Benaia onye Piraton, sitere n'umu Efraim: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya. 15 Onye-isi nke-iri-na-abua nke diri ọnwa nke-iri-na-abua bu Heldai onye Netofa, nke Ọtniel: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya. 16 Ndi-isi kwa nke ebo nile nke Israel: nke ndi Reuben, Elieza nwa Zikri bu onye-ndú: nke ndi Simeon, Shefataia nwa Meaka: 17 nke Livai, Hashabaia nwa Kemuel: nke Eron, Zedok: 18 nke Juda, Elaihu, onye sitere n'umu-nne-Devid: nke Isaka, Ọmri nwa Maikael: 19 nke Zebulun, Ishmaia nwa Obadaia: nke Naftali, Jerimot nwa Azriel: 20 nke umu Efraim, Hoshea nwa Azazaia: nke nkera ebo Manase, Joel nwa Pedaia: 21 nke nkera ebo Manase di na Gilead, Ido nwa Zekaraia: nke Benjamin, Jaasiel nwa Abnea: 22 nke Dan, Azarel nwa Jeroham. Ndia bu ndi-isi ebo nile nke Israel. 23 Ma Devid agutaghi ọnu-ọgugu-ha site n'onye b͕ara orú arọ we rida: n'ihi na Jehova siri na Ọ gēme ka Israel ba uba dika kpakpando nke elu-igwe. 24 Joab nwa Zeruaia malitere iguta ha, ma ọ guzughi; iwe we dikwasi Israel n'ihi nka; etiyeghi kwa ọnu-ọgugu n'ọnu-ọgugu nke di n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke eze, bú Devid. 25 Onye-isi ulo-àkù nile nke eze bu Azmavet nwa Adiel: onye-isi ulo-àkù nile nke di n'ọhia, na n'obodo nile, na n'obodo ntà nile, na n'ulo-elu nile, bu kwa Jehonatan nwa Uzaia: 26 onye-isi ndi nēje ozi ubi ilu ọlu ala-ubi bu Ezri nwa Kelub: 27 onye-isi ubi-vine nile bu Shimai onye Rema: onye-isi nke ihe di n'ubi-vine itiye n'ulo nile anēdebe manya-vine bu Zabdi onye Shefam: 28 onye-isi osisi olive nile na osisi sycomore nile nke di n'ebe di ala ala bu Beal-hanam onye Geda: onye-isi ulo nile anēdebe manu bu Joash: 29 onye-isi ìgwè ehi nke nāta nri nime Sheron bu Shitrai onye Sheron: onye-isi ìgwè ehi nke di nime ndagwurugwu nile bu Shefat nwa Adlai: 30 onye-isi camel nile bu Obil onye Ishmael: onye-isi inyinya-ibu nile bu Jehdeia onye Meronot: 31 onye-isi ìgwè ewu na aturu bu Jaziz onye Haga. Ndia nile bu ndi-isi àkù nke Devid nwere. 32 Jonatan nwa-nne nna Devid bu onye nādu ọdu, nwoke nwere nghọta na ode-akwukwọ ka ọ bu: Jehiel nwa Hakmoni nọye-kwa-ra umu-ndikom eze: 33 Ahitofel bu kwa onye nādu eze ọdu: Hushai onye-Akait bu eyì eze: 34 ma nke nēso Ahitofel bu Jehoiada nwa Benaia, na Abaiata: onye-isi usu-ndi-agha eze bu Joab.

1 Ihe Emere 28

1 Devid we kpọkọta ndi-isi nile nke Israel, bú ndi-isi ebo nile, na ndi-isi òkè nile ndi nējere eze ozi, na ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri, na ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise, na ndi-isi àkù na anu-ulo nile eze nwere, na nke umu-ya ndikom nwere, ha na ndi-onozi, na ndi-dike, ọbuná dike ọ bula nke bu dìnkpà, rue Jerusalem. 2 Devid, bú eze, we guzo ọtọ n'ukwu-ya abua, si, Nurunum, umu-nnem, na ndim: mu onwem, ọ di n'obim iwuru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova ulo izu-ike, nke gābu kwa ihe-nb͕akwasi-ukwu Chineke-ayi; m'we dozie ihe iji ewu ulo. 3 Ma Chineke sirim, I gaghi-ewuru aham ulo, n'ihi na nwoke agha ka i bu, i wusiwo kwa ọbara. 4 Ma Jehova, bú Chineke Israel, rọputaram n'etiti ulo nile nke nnam ibu eze Israel rue mb͕e ebighi-ebi: n'ihi na Juda ka Ọ rọputara ibu onye-ndú; ma n'ulo Juda Ọ rọputara ulo nnam; ma n'etiti umu-ndikom nnam ihem tọrọ Ya utọ imem ka m'buru eze Israel nile: 5 ma n'etiti umum ndikom nile, (n'ihi na ọtutu umu-ndikom ka Jehova nyerem, ) O we rọputa Solomon nwam inọkwasi n'oche-eze nke ala-eze Jehova dika onye-isi Israel. 6 O we sim, Solomon nwa-gi, onye ahu gēwu ulom na ogigem nile: n'ihi na arọputawom ya iburum nwa, Mu onwem gābu-kwa-ra ya nna. 7 M'gēme kwa ka ala-eze-ya guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi, ọ buru na ọ di ike ime ihe nile M'nyere n'iwu na ikpém nile, dika esi eme ta. 8 Ma ub͕u a, n'anya Israel nile, bú nkpọkọta Jehova kpọkọtara, ma na nti Chineke-ayi, debenu, chọ kwa ihe nile Jehova, bú Chineke-unu, nyere n'iwu: ka unu we nweta ezi ala nka, me kwa ka umu-unu keta ya rue mb͕e ebighi-ebi, bú ndi gānọchi unu. 9 Ma gi onwe-gi, Solomon nwam, mara Chineke nke nna-gi, were obi zuru okè, were kwa nkpuru-obi ọ nātọ utọ, fè Ya òfùfè: n'ihi na nkpuru-obi nile ka Jehova nēnyocha, Ọ nāghọta kwa nchèputa nile ọ bula nke èchìchè: ọ buru na i chọ Ya, Ọ gēme ka i chọta Ya; ma ọ buru na i rapu Ya, Ọ gāju gi rue mb͕e ebighi-ebi. 10 Ub͕u a le anya; n'ihi na Jehova arọputawo gi iwu ulo ibu ebe nsọ: di ike, me ya. 11 Devid we nye Solom nwa-ya ihe-atù nke uzọ-nbata ulo uku Chineke, na nke ulo-ya nile, na nke ulo-àkù-ya nile, na nke ime-ulo-elu-ya nile, na nke ime-ime-ulo-ya nile, na nke ulo ebe-nkpuchi-nmehie: 12 na ihe-atù ihe nile nke di n'aka-ya site na Mọ Nsọ bayere ogige nile nke ulo Jehova, baye-kwa-ra ime-ulo nile di buruburu, bayere ulo-àkù nile nke ulo Chineke, baye-kwa-ra ulo-àkù nile nke ihe nsọ nile: 13 baye-kwa-ra òkè nile nke ndi-nchu-àjà na ndi Livai, baye-kwa-ra ije-ozi nile nke òfùfè ulo Jehova, baye-kwa-ra ihe nile nke òfùfè ulo Jehova: 14 nke ọla-edo n'ọtùtù bayere ihe ọla-edo, bú ihe nile nke òfùfè ọ bula; nke ọla-ọcha bayere ihe ọla-ọcha nile n'ọtùtù, bú ihe nile nke òfùfè ọ bula: 15 n'ọtùtù kwa bayere ihe-idọba-oriọna nke ọla-edo na oriọna nile ha nke ọla-edo, n'ọtùtù bayere ihe-idọba-oriọna ọ bula na oriọna-ya nile: baye-kwa-ra ihe-idọba-oriọna nile nke ọla-ọcha, ọla-ọcha n'ọtùtù bayere ihe-idọba-oriọna ọ bula na oriọna-ya nile, dika òfùfè ihe-idọba-oriọna ọ bula: 16 na ọla-edo n'ọtùtù bayere table nile achicha anēdo n'usoro, bú table ọ bula; ọla-ọcha kwa bayere table ọla-ọcha nile: 17 na ndudu nile, na ọkwa-nwusa nile, na iko nile, nke ọla-edo anāgwaghi agwa: baye-kwa-ra ọkwa ntà ọla-edo nile n'ọtùtù bayere ọkwa ntà ọ bula; baye-kwa-ra ọkwa ntà ọla-ọcha nile n'ọtùtù bayere ọkwa ntà ọ bula: 18 baye-kwa-ra ebe-ichu-àjà nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ ọla-edo anuchara n'ọku n'ọtùtù: baye-kwa-ra ihe-atù ub͕ọ-ala, bú cherubim, ọla-edo, ndi nāb͕asa nkù-ha, kpuchie ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova. 19 Ihe a nile ka Jehova were odide-akwukwọ me ka m'mata site n'aka-Ya n'arum, ka Devid kwuru, bú ije-ozi nile nke ihe-atù a. 20 Devid we si Solomon nwa-ya, Di ike, nwe kwa ume, me ya: atula egwu, atu-kwa-la ujọ: n'ihi na Jehova Chineke, bú Chinekem, nọyere gi; Ọ gaghi-ara gi aka, Ọ gaghi-arapu kwa gi, rue mb͕e i jezuru ozi nile nke òfùfè ulo Jehova. 21 Ma le, òkè nile nke ndi-nchu-àjà na ndi Livai di, ifè òfùfè nile nke ulo Chineke: onye ọ bula nke nwere afọ-ofufo n'amam-ihe gādi kwa n'aka-gi n'ije-ozi ọ bula, ifè òfùfè ọ bula: ndi-isi na ndi Israel nile gēme kwa ka okwu-gi nile si di.

1 Ihe Emere 29

1 Devid, bú eze, we si nkpọkọta Israel nile, Solomon nwam, onye Chineke rọputaworo nání ya, bu nwata, ọ di kwa nrò, ma ije-ozi a di uku: n'ihi na ọ bughi madu ka ulo uku a diri, kama ọ bu Jehova, bú Chineke. 2 Ma ewerewom ikem nile doziere ulo Chinekem ọla-edo iji me ihe ọla-edo, na ọla-ọcha iji me ihe ọla-ọcha, na ọla iji me ihe ọla, na ígwè iji me ihe ígwè, na osisi iji me ihe osisi; na nkume onyx, na nkume nhiọgide, na nkume ichọ-nma, na nke turu agwa, na nkume nile di oké ọnu-ahia, na nkume marble n'uba. 3 Ọzo kwa, n'ihi na ihe ulo Chinekem nātọm utọ, ebe m'nwere ihe nke akam, bú ọla-edo na ọla-ọcha, ewerewom ya nye ulo Chinekem, tukwasi ihe nile m'doziworo nye ulo nsọ ahu; 4 bú nnù talent ọla-edo asa na ọgu iri, nke ọla-edo Ofia, na nnù talent ọla-ọcha iri-na-asa na ọgu iri, bú nke anuchara n'ọku, iji machita mb͕idi nile nke ulo nile: 5 ọla-edo ahu bu iji me ihe ọla-edo, ọla-ọcha ahu bu kwa iji me ihe ọla-ọcha, na iji je ozi nile ọ bula n'aka ndi-ọ̀kà. Ònye kwa nēwere afọ-ofufo nye onwe-ya imejuru Jehova aka-ya ta? 6 Ndi-isi ulo nke ndi bu nna, na ndi isi ebo Israel nile, na ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri, na nke usu nile nke ọgu ndikom ise, ọbuná rue ndi-isi ije-ozi eze, we were afọ-ofufo nye onwe-ha. 7 Ha we nye iji fè òfùfè ulo Chineke ọla-edo nnù talent iri-na-abua na ọgu iri, na orú nnù darie na nnù ise, na ọla-ọcha orú nnù talent na nnù ise, na ọla orú nnù uzọ abua na nnù ise, na ígwè orú nnù talent uzọ iri-na-abua na nnù iri. 8 Ndi achọtara nkume di oké ọnu-ahia n'aka-ha we nye ha itiye n'ulo-àkù nke ulo Jehova, n'aka Jehiel onye Giashon. 9 Ndi Israel we ṅuria ọṅu, n'ihi na ha were afọ-ofufo nye onwe-ha, n'ihi na n'obi zuru okè ka ha were afọ-ofufo nye Jehova onwe-ha: ọzọ kwa, Devid, bú eze, ṅuriri ọṅu uku. 10 Devid we gọzie Jehova n'anya nkpọkọta ahu nile: Devid we si, Onye agọziri agọzi ka I bu, Jehova, bú Chineke Israel nna-ayi, site na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi. 11 Jehova, Gi nwe idi-uku, na idi-ike, na ima-nma, na nmeri, na ebube: n'ihi na ihe nile di n'elu-igwe na n'uwa bu nke Gi; Jehova, Gi nwe ala-eze, Gi bu kwa Onye anēweli elu iburu ihe nile onye-isi. 12 Ma àkù ma nsọpuru nēsite n'ebe I nọ bia, Gi onwe-gi nāchi kwa ihe nile; ọ bu kwa n'aka-Gi ka ume na idi-ike di; n'aka-Gi ka ọ di kwa ime uku, na ime ka ihe nile di ike. 13 Ma ub͕u a, Chineke-ayi, ayi onwe-ayi nēkele Gi, nēto kwa aha-Gi mara nma. 14 Ma ònye ka mu onwem bu, òle ndi ka ndim bu kwa, na ayi nwere ike iwere afọ-ofufo nye Gi onwe-ayi otú a? n'ihi na n'ebe I nọ ka ihe nile si bia, ọ bu kwa ihe si n'aka-Gi bia ka ayi nyere Gi. 15 N'ihi na ndi-ọbìa ka ayi bu n'iru Gi, na ndi-nnọdu, dika nna-ayi-hà nile: ubọchi nile ayi n'elu uwa di ka onyinyo, olile-anya adighi kwa. 16 Jehova, bú Chineke-ayi, ọtutu ihe nile a nke ayi doziworo iwuru Gi ulo n'ihi aha nsọ Gi, n'aka-Gi ka o siri bia, ọ bu kwa Gi nwe ya nile. 17 Chinekem, ama-kwa-ram na Gi onwe-gi nānwaputa obi, izi-ezi nātọ kwa Gi utọ. Mu onwem, n'izi-ezi obim ka m'were afọ-ofufo nye Gi ihe nile ndia: ma ub͕u a ndi-gi, ndi ahutara n'ebe a, ewerewom ọṅù hu ha ka ha nēwere afọ-ofufo nye Gi onwe-ha. 18 Jehova, Chineke nke Abraham na Aisak na Israel, bú nna-ayi-hà, debe nka nime nchèputa nke èchìchè nile nke obi ndi-Gi rue mb͕e ebighi-ebi, me kwa ka obi-ha guzosie ike n'ebe I nọ: 19 nye kwa Solomon nwam obi zuru okè, idebe ihe nile I nyere n'iwu, na ihe-àmà-Gi nile, na ukpuru-Gi nile, na ime ihe ndia nile, na iwu ulo uku ahu, nkem'doziworo ihe bayere ya. 20 Devid we si nkpọkọta ahu nile, Biko, gọzienu Jehova, bú Chineke-unu. Nkpọkọta ahu nile we gọzie Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, ha we rube isi, kpọ isi ala nye Jehova, nye kwa eze. 21 Ha we chuara Jehova àjà, sure-kwa-ra Jehova àjà-nsure-ọku, n'echi ubọchi ahu, bú nnù oke-ehi abua na ọgu iri, na nnù ebulu abua na ọgu iri, na nnù umu-aturu abua na ọgu iri, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha, ọbuná àjà n'uba bayere Israel nile; 22 ha we were ọṅù uku rie ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu n'iru Jehova ubọchi ahu. Ha we me Solomon nwa Devid eze nke ub͕ò abua, te ya manu nye Jehova ibu onye-ndú, ha te-kwa-ra Zedok manu ibu onye-nchu-aja. 23 Solomon we nọkwasi n'oche-eze Jehova, buru eze n'ọnọdu Devid, bú nna-ya, ihe we nāgara ya nke-ọma; Israel nile we nēge ya nti. 24 Ndi-isi nile, na ndi-dike, na umu-ndikom nile kwa nke eze, bú Devid, kweye-kwa-ra inọ n'okpuru Solomon, bú eze. 25 Jehova we me ka Solomon di uku ri nne n'anya Israel nile, O we tiyekwasi ya ebube ala-eze nke anātukwasighi eze Israel ọ bula nke buru ya uzọ. 26 Ma Devid nwa Jesi bu eze Israel nile. 27 Ma ubọchi nile ọ bu eze Israel di ọgu arọ abua; arọ asa ka ọ bu eze na Hebron, orú arọ na iri na atọ ka ọ bu kwa eze na Jerusalem. 28 O we nwua n'ezi isi-awọ, ubọchi nile nke ndu-ya na àkù na nsọpuru ju-kwa-ra ya afọ: Solomon nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya. 29 Ma ihe nile Devid, bú eze, mere, nke-mbu na nke-ikpe-azu, le, edewo ha n'akwukwọ ihe emere nke Samuel, bú onye-ọhu-uzọ, na n'akwukwọ ihe emere nke Netan, bú onye-amuma, na n'akwukwọ ihe emere nke Gad, bú onye-ọhu-uzọ; 30 tiyere ọbubu-eze-ya nile, na idi-ike-ya, na mb͕e nile nke gabigara n'isi ya, na n'isi Israel, na n'isi ala-eze nile nke ala di iche iche.

2 Ihe Emere 1

1 Solomon nwa Devid we me onwe-ya ka ọ di ike n'ala-eze ya, Jehova, bú Chineke-ya, we nọyere ya, me ka ọ di uku ri nne. 2 Solomon we gwa Israel nile okwu, bú ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri na nke usu nile nke ọgu ndikom ise, na ndi-ikpe, na onye-isi ọ bula nke Israel nile, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna. 3 Solomon, ya na nkpọkọta ahu nile, we jerue ebe di elu nke di na Gibeon; n'ihi na n'ebe ahu ka ulo-ikwū nzute nke Chineke di, bú nke Moses, bú orù Jehova, mere n'ọzara. 4 Ma Devid siri na Kiriat-jearim bugota ib͕e Chineke rue ọnọdu nke Devid doziri ya: n'ihi na ọ mara ulo-ikwū nye ya nime Jerusalem. 5 Ma ebe-ichu-àjà ọla ahu, nke Bezalel nwa Uri, nwa Hua, mere, di n'ebe ahu n'iru ebe-obibi Jehova: Solomon na nkpọkọta ahu we chọ ya. 6 Solomon we rigo n'ebe ahu rue ebe-ichu-àjà ọla n'iru Jehova, nke di n'ulo-ikwū nzute, o we sure nnù àjà-nsure-ọku abua na ọgu iri n'elu ya. 7 N'abali ahu ka Chineke mere ka Solomon hu ya anya, O we si ya, Riọ ihe M'gēnye gi. 8 Solomon we si Chineke, Gi onwe-gi emeworo Devid nnam ebere uku, I we mem eze n'ọnọdu ya. 9 Ub͕u a, Jehova, bú Chineke, ka okwu-Gi nke I gwara Devid nnam buru ihe kwesiri ntukwasi-obi: n'ihi na Gi onwe-gi emewom eze otù ndi nke bara uba dika ájá ala. 10 Ub͕u a nyem amam-ihe na ihe-ọmuma, ka m'we nāpu apu nābata kwa abata n'iru ndi nka: n'ihi na ònye gēkpe ndi-Gi nka di uku ikpe? 11 Chineke we si Solomon, N'ihi na nka di n'obi-gi, ma i riọghi àkù, ma-ọbu ihe-nkpakọta, ma-ọbu nsọpuru, ma-ọbu ndu ndi nākpọ gi asì, i riọghi kwa ọtutu ubọchi; kama i riọworo onwe-gi amam-ihe na ihe-ọmuma, ka i we kpe ndim ikpe, bú ndi M'meworo gi eze-ha: 12 enyewo gi amam-ihe na ihe-ọmuma; M'gēnye kwa gi àkù, na ihe-nkpakọta, na nsọpuru, nke ndi-eze ndi buru gi uzọ nēnweghi otú a, ọ dighi kwa onye nke gēso gi gēnwe otú a. 13 Solomon we si n'ije ọ jeruru ebe di elu nke di na Gibeon, si n'iru ulo-ikwū nzute, biarue Jerusalem; o we buru eze Israel. 14 Solomon we chikọta ub͕ọ-ala na ndi-inyinya: o we nwe nnù ub͕ọ-ala atọ na ọgu iri, na orú nnù ndi-inyinya na nnù iri, o we do ha n'obodo ub͕ọ-ala, na n'ebe eze nọ na Jerusalem. 15 Eze we me ọla-ọcha na ọla-edo ka ọ di ka nkume na Jerusalem, o me-kwa-ra osisi cedar ka ha di ka osisi sycomore nke di n'ebe di ala ala n'uba. 16 Anēme kwa ka inyinya Solomon nwere si n'Ijipt puta; n'usu ka ndi-ahia eze nānara ha, otù usu n'ọnu-ahia-ya. 17 Ha we me ka otù ub͕ọ-ala rigota si n'Ijipt puta na nnù shekel ọla-ọcha na ọgu iri, na otù inyinya n'ọgu shekel asa na iri: otú a ka ha nēweputara eze nile nke ndi Het, na ndi-eze Siria, site n'aka-ha.

2 Ihe Emere 2

1 Solomon we si na o gēwuru aha Jehova ulo, wu-kwa-ra ala-eze-ya ulo. 2 Solomon we guta orú nnù ndikom uzọ asatọ na nnù iri-na-ise, bú ndi-ibu, na orú nnù ndikom uzọ iri ndi nāwa ihe-ọwuwa n'ugwu, na nnù ndikom iteghete ndi edoro ndi-isi-ha. 3 Solomon we zigara Huram, bú eze Taia, ozi, si, Otú i mere Devid nnam, we zitere ya osisi cedar iwuru ya ulo ibi nime ya, me-kwa-ram otú a. 4 Le, mu onwem nēwuru aha Jehova, bú Chinekem, ulo, idoro Ya nsọ, isure n'iru Ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me, na idebe n'ebe ahu achicha anēdo n'usoro mb͕e nile, na isure àjà-nsure-ọku n'ututu na n'anyasi, na n'ubọchi-izu-ike nile, na n'ọnwa ọhu nile, na mb͕e nile akara àkà nke Jehova, bú Chineke-ayi. Rue mb͕e ebighi-ebi ka nka dikwasi Israel. 5 Ma ulo nke mu onwem nēwu di uku, n'ihi na Chineke-ayi di uku kari chi nile. 6 Ma ònye nwere ike iwuru Ya ulo, n'ihi na elu-igwe na elu-igwe nke elu-igwe nāgaghi-anagide Ya? ònye kwa ka mu onwem bu, na m'gēwuru Ya ulo, ma-ọbughi nání isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'iru Ya? 7 Ma ub͕u a ziterem otù nwoke mara ihe n'ilu ọlu n'ọla-edo, na n'ọla-ọcha, na n'ọla, na n'ígwè, na n'ogho ododo na ogho uhie na ogho anunu, onye ma-kwa-ra iso ndi mara ihe, ndi nọ n'ebe m'nọ na Juda na nime Jerusalem, bú ndi Devid nnam doziri, b͕u eb͕ub͕u. 8 Si kwa na Lebanon ziterem osisi cedar, na osisi fir, na osisi algum: n'ihi na mu onwem amawo na ndi-orù-gi mara ib͕utu osisi nime Lebanon; ma, le, ndi-orùm gēso kwa ndi-orù-gi, 9 ọbuná idozirim osisi n'uba: n'ihi na ulo ahu nke mu onwem nēwu gādi uku di kwa ebube. 10 Ma, le, m'gēnye ndi-orù-gi, bú ndi nāwa ihe-ọwuwa ndi nēb͕utu osisi, orú nnù ọtùtù cor uzọ abua na nnù iri nke ọka wheat asuru asu, na orú nnù ọtùtù cor uzọ abua na nnù iri nke ọka barley, na orú nnù ọtùtù bath uzọ abua na nnù iri nke manya-vine, na orú nnù ọtùtù bath uzọ abua na nnù iri nke manu. 11 Huram, bú eze Taia, we were odide-akwukwọ, nke o zitere Solomon, si, N'ihi na Jehova huru ndi-Ya n'anya, n'ihi ya ka O mere gi eze-ha. 12 Huram we si, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke Israel, bu, Onye mere elu-igwe na uwa, Onye nyeworo Devid, bú eze, nwa-nwoke nke mara ihe, onye mara ezi uche na nghọta, onye gēwuru Jehova ulo, wu-kwa-ra ala-eze-ya ulo. 13 Ma ub͕u a ezitewom otù nwoke nke mara ihe, onye mara nghọta, nke Huram, bú nnam, 14 bú nwa nke nwayi nke sitere n'umu-ndinyom Dan, ma nna-ya bu nwoke Taia, ọ bu onye mara ilu ọlu n'ọla-edo, na n'ọla-ọcha, na n'ọla, na n'ígwè, na nkume, na n'osisi, na n'ogho ododo, na n'ogho anunu, na n'ezi ákwà ọcha, na n'ogho uhie; na ib͕u eb͕ub͕u ọ bula, na ichèputa ihe-nchèputa ọ bula: ka ewe nye ya ọnọdu n'etiti ndi-gi mara ihe, na ndi mara ihe nke onye-nwem, bú Devid nna-gi. 15 Ma ub͕u a ọka wheat ahu na ọka barley ahu na manu ahu na manya-vine ahu, bú nke onye-nwem kwuru, ya zitere ndi-orù-ya: 16 Ayi onwe-ayi gēb͕utu kwa osisi site na Lebanon, dika nkpà-gi nile si di: ayi gāb͕a kwa ha me ka ha se n'elu oké osimiri rue gi aru, rue Jafo; gi onwe-gi gēbugota kwa ha na Jerusalem. 17 Solomon we gua ndikom nile, bú ndi-ọbìa, ndi nọ n'ala Israel, mb͕e ọgugu ahu gasiri, bú nke Devid nna-ya guru ha; ewe hu na ha di orú nnù ndikom uzọ iri-na-iteghete na nnù anọ. 18 O we me orú nnù uzọ asatọ na nnù iri-na-ise nime ha ka ha buru ndi-ibu, na orú nnù uzọ iri ka ha buru ndi nāwa ihe-ọwuwa n'ugwu, na nnù iteghete ka ha buru ndi edoro ndi-isi ime ka ndi ahu fè òfùfè.

2 Ihe Emere 3

1 Solomon we malite iwu ulo Jehova nime Jerusalem n'ugwu Moraia, ebe Jehova mere ka Devid, bú nna-ya, hu Ya anya, nke o doziri n'ebe Devid rọputara, n'ebe-nzọcha-ọka Ọnan, bú onye Jebus. 2 O we malite iwu ulo ahu n'ubọchi nke-abua n'ọnwa nke-abua, n'arọ nke-anọ ọ bu eze. 3 Ma n'ihe ndia ka adọrọ Solomon aka na nti iwu ulo Chineke. Ogologo-ya na cubit n'ọtùtù mbu di ọgu cubit atọ, obosara-ya di kwa orú cubit. 4 Uzọ-nbata kwa nke di n'iru ulo ahu, ogologo-ya di orú cubit, n'iru obosara ulo ahu, idi-elu-ya di kwa ọgu cubit isi: o we were ọla-edo anāgwaghi agwa machita ya nime. 5 O were kwa osisi fir kpuchie ulo ahu nke di kari uku, o we were ezi ọla-edo kpuchie ya, tua akika nkwu na iyab͕a n'elu ya. 6 O were kwa nkume di oké ọnu-ahia n'ima-nma machita ulo ahu: ọla-edo-ya bu kwa ọla-edo Pavaim. 7 O were kwa ọla-edo kpuchie ulo ahu, bú ntuhie-ya nile, na nbata-uzọ-ya nile, na mb͕idi-ya nile, na ibo-ọnu-uzọ-ya nile; o b͕u-kwa-ra eb͕ub͕u cherubim na mb͕idi-ya nile. 8 O me-kwa-ra ulo nsọ kachasi ulo nsọ nile; ogologo-ya di orú cubit, n'iru obosara ulo ahu, obosara-ya di kwa orú cubit: o were ezi ọla-edo, ra ka nnù talent na ọgu iri, kpuchie ya. 9 Ọtùtù ǹtú-ya nile di ọgu shekel ọla-edo abua na iri. O were kwa ọla-edo kpuchie ime-ulo-elu nile. 10 O me kwa cherubim abua, bú ihe emere dika ihe apiri api, n'ulo nsọ ahu kachasi ulo nsọ nile; ha machita ha ọla-edo. 11 Ma nkù cherubim ahu, ogologo-ha di orú cubit: nkù otù cherub di cubit ise, nēmetu mb͕idi ulo ahu; nkù-ya nke-ọzọ di kwa cubit ise, nēmetu nkù cherub nke-ọzọ. 12 Nkù cherub nke-ọzọ di kwa cubit ise, nēmetu mb͕idi ulo: nkù-ya nke-ọzọ di cubit ise, nārapara na nkù cherub nke-ọzọ. 13 Nkù cherubim ndia nāb͕asa orú cubit: ha onwe-ha nēguzo kwa n'ukwu-ha, iru-ha che-kwa-ra n'ulo. 14 O me-kwa-ra ákwà-nb͕ochi nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha, o we tua akika cherubim n'elu ya. 15 O me kwa n'iru ulo ogidi abua, orú cubit na iri na ise ka ogologo-ha di, isi nke di n'elu-ha n'otù n'otù di kwa cubit ise. 16 O me kwa iyab͕a n'ime-ime-ulo ahu, tiye ha n'elu ogidi ahu; o me-kwa-ra ọgu pomegranate ise, tiye ha n'elu iyab͕a. 17 O guzo ogidi abua ahu n'iru ulo uku Chineke, otù n'aka-nri, otù n'aka-ekpe; o we kpọ aha ogidi aka-nri Jakin, na aha ogidi aka-ekpe Boaz.

2 Ihe Emere 4

1 O me-kwa-ra ebe-ichu-àjà ọla, orú cubit ka ogologo-ya di, orú cubit ka obosara-ya di kwa, cubit iri ka idi-elu-ya di kwa. 2 O me-kwa-ra oké osimiri awuru awu, cubit iri site n'otù ọnu-ya rue ọnu-ya nke-ọzọ, ọ di buruburu buruburu, cubit ise ka idi-elu-ya di; eriri nke orú cubit na iri b͕a-kwa-ra ya buruburu. 3 Oyiyi ehi di kwa n'okpuru ya, ndi nọ ya buruburu buruburu, ha di cubit iri, nāb͕a oké osimiri ahu buruburu. Ehi ahu di iri na abua, awuru mb͕e awuru ya. 4 O nēguzo n'elu ehi iri na abua, atọ nēche iru n'Ugwu, atọ nēche iru n'Ọdida-anyanwu, atọ nēche iru na Ndida, atọ nēche iru n'Ọwuwa-anyanwu: oké osimiri ahu we dikwasi ha n'elu, azu-ha nile di kwa nime. 5 Ib͕idi-ya di otù ntù-ọbu-aka; emere ọnu-ya dika anēme ọnu iko, dika okoko urodi: ọ nānara nagide kwa nnù bath asa na ọgu iri. 6 O me-kwa-ra ite ọsisa-miri iri, tiye ise n'aka-nri, na ise n'aka-ekpe, iji sa anu; ihe diri àjà-nsure-ọku ka ha nāṅacha nime ha: ma oké osimiri ahu diri ndi-nchu-àjà iji sa aru. 7 O me kwa ihe-idọba-oriọna iri nke ọla-edo dika ikpé-ha si di; o tiye ha n'ulo uku Chineke, ise n'aka-nri, na ise n'aka-ekpe. 8 O me kwa table iri, dọba ha n'ulo uku Chineke, ise n'aka-nri, na ise n'aka-ekpe. O me kwa ọgu ọkwa-nwusa ise nke ọla-edo. 9 O me kwa ogige ndi-nchu-àjà, na ogige uku ahu, na ibo-ọnu-uzọ itiye n'ogige ahu, were ọla machita ibo-ọnu-uzọ-ha. 10 O tiye oké osimiri ahu n'akuku aka-nri ulo ahu n'akuku Iru-anyanwu na ncherita-iru Ndida. 11 Huram me-kwa-ra ite nile, na osekè nile, na ọkwa-nwusa nile. Huram we jebìe ozi nke o jere eze, bú Solomon, n'ulo Chineke: 12 ogidi abua ahu, na ọkwa abua ahu, na isi abua ahu nke di n'elu ogidi abua; na ihe-ọkpukpa abua ahu ikpuchi ọkwa abua nke isi nke di n'elu ogidi; 13 na nnù pomegranate ahu nke diri ihe-ọkpukpa abua ahu; bú ariri pomegranate abua bayere otù ihe-ọkpukpa, ikpuchi ọkwa abua nke isi nke di n'iru ogidi. 14 O me-kwa-ra ihe-ndọkwasi iri ahu, me kwa ite ọsisa-miri iri ahu nke di n'elu ihe-ndọkwasi; 15 na otù oké osimiri ahu, na ehi iri na abua ahu nke di n'okpuru ya. 16 Na ite nile, na osekè nile, na ndudu nile, na ihe-ha nile, ndia ka Huram nna-ya mere eze, bú Solomon, bayere ulo Jehova, ha bu ọla echichara echicha. 17 Na buruburu-ala Jọdan ka eze wuru ha, n'ala urọ n'etiti Sukot na Zerida. 18 Solomon we me ihe ndia nile n'uba nke-uku: n'ihi na achọputaghi ọtùtù ọla ahu. 19 Solomon me-kwa-ra ihe nile nke di n'ulo Chineke, ebe-ichu-àjà ọla-edo kwa, na table nke achicha iru Chineke di n'elu ha; 20 na ihe-idọba-oriọna na oriọna nile ha, inwu enwu dika ikpé si di n'iru ime-ime-ulo ahu, ha bu ọla-edo makarisiri nma; 21 na okoko-osisi nile, na oriọna nile, na nkpa nile, ha bu ọla-edo, nke ahu bu ọla-edo dizu nma; 22 na ihe-ikpakepu-ọku nile, na ọkwa-nwusa nile, na ngaji nile, na ihe-igu-ọku nile, ha bu ọla-edo makarisiri nma: ọnu-uzọ ulo ahu kwa, ibo-ọnu-uzọ ime-ime ya nile nke diri ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile, na ibo-ọnu-uzọ nile nke ulo ahu, bú ulo uku Chineke, bu ọla-edo.

2 Ihe Emere 5

1 Ewe jezue ozi nile nke Solomon jere ulo Jehova. Solomon we webata ihe nile Devid, bú nna-ya, doro nsọ; bú ọla-ọcha, na ọla-edo, na ihe nile, o tiye ha n'ulo-àkù nke ulo Chineke. 2 Mb͕e ahu Solomon kpọkọtara ndi-okenye Israel, na ndi-isi nile nke ebo nile ha, bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna umu Israel, ibiaru Jerusalem, isi n'obodo Devid, nke ahu bu Zaion, bugota ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova. 3 Ndikom nile nke Israel we kpọkọta onwe-ha biakute eze n'ememe, nke ahu bu ọnwa nke-asa. 4 Ndi-okenye nile nke Israel we bia, ndi Livai we bulie ib͕e ahu. 5 Ha we bugota ib͕e ahu, na ulo-ikwū nzute, na ihe nsọ nile nke di n'Ulo-ikwū ahu; ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, bugotara ha. 6 Eze, bú Solomon, na nzukọ nile nke Israel, bú ndi nēzukọta n'ebe ọ nọ, nọ n'iru ib͕e ahu, nāchu n'àjà ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, nke anādighi-agu ha ọnu, nke anādighi-aguta kwa ha n'ihi iba-uba-ha. 7 Ndi-nchu-àjà we bubata ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova n'ebe-ya, nime ime-ime-ulo nke ulo ahu, rue ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile, rue n'okpuru nkù cherubim. 8 N'ihi na cherubim nāb͕asa nkù-ha n'elu ebe ib͕e ahu, cherubim ahu we nēkpuchi ib͕e ahu na nkpa-n'aka-ya abua n'elu. 9 Nkpa-n'aka di ogologo, ewe hu isi nkpa-n'aka site n'ib͕e ahu n'iru ime-ime-ulo ahu; ma adighi-ahu ha n'èzí: o we di n'ebe ahu, rue ta. 10 Ọ dighi ihe di n'ib͕e ahu, ọ bu nání mbadamba nkume abua nke Moses tiyere nime ha na Horeb, mb͕e Jehova na umu Israel b͕ara ndu, mb͕e ha siri n'Ijipt puta. 11 O rue, mb͕e ndi-nchu-àjà siri n'ebe nsọ puta, (n'ihi na ndi-nchu-àjà nile ahuru doro onwe-ha nsọ, ọ dighi onye ọ bula idebe ihe n'òkè n'òkè; 12 ọzọ, ndi Livai, bú ndi-ọbù-abù, ọbuná ha nile, bú Esaf na Himan, na Jedutun, na umu-ha ndikom, na umu-nne-ha, nēguzo kwa n'akuku ọwuwa-anyanwu nke ebe-ichu-àjà ahu, yiri ezi ákwà ọcha, chiri kwa ájà na une na ubọ-akwara, ọgu ndi-nchu-àjà isi ndi nāfù opi so-kwa-ra ha: ) 13 o we rue, mb͕e ndi nāfù opì na ndi-ọbù-abù di ka otù onye, ime ka anu otù olu n'ito na n'ikele Jehova, mb͕e ha were kwa opì na ájà, na ihe abù, na otuto eji to Jehova, welie olu-ha elu, si, N'ihi na Ọ di nma: n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: na igwe-oji juputara ulo ahu, bú ulo Jehova, 14 ndi-nchu-àjà we ghara inwe ike iguzo ije ozi n'ihi igwe-oji ahu: n'ihi na ebube Jehova juputara ulo Chineke.

2 Ihe Emere 6

1 Mb͕e ahu Solomon siri, Jehova asiwo na O gēbi n'oké ọchichiri. 2 Ma mu onwem ewuworo Gi ulo obibi, bú ọnọdu guzosiri ike ebe I gēbi rue mb͕e ebighi-ebi. 3 Eze we chigharia iru-ya, gọzie nkpọkọta nile nke Israel: nkpọkọta nile nke Israel nēguzo kwa. 4 Ọ si, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke Israel, bu, Onye were ọnu-Ya gwa Devid, bú nnam, okwu, were kwa aka-Ya abua mezue ya, si, 5 Site n'ubọchi mb͕e M'mere ka ndim si n'ala Ijipt puta, arọputaghm obodo n'ebo nile nke Israel iwu ulo, ka aham we di n'ebe ahu; arọputaghkwam nwoke ọ bula ibu onye-ndú ndim, bú Israel: 6 ma arọputaram Jerusalem, ka aham we di n'ebe ahu; arọputa-kwa-ram Devid ibu onye-isi ndim, bú Israel. 7 O we di n'obi Devid, bú nnam, iwuru aha Jehova, bú Chineke Israel, ulo. 8 Jehova we si Devid, bú nnam, N'ihi na ọ di n'obi-gi iwuru aham ulo, i mere nke-ọma na ọ di n'obi-gi: 9 otú ọ di gi onwe-gi agaghi-ewu ulo ahu; kama, nwa-gi nwoke nke nēsi n'úkwù-gi puta, onye ahu gēwuru aham ulo. 10 Jehova emewo kwa ka okwu-Ya nke O kwuru guzosie ike; m'we bilie n'ọnọdu Devid, bú nnam, nọkwasi n'oche-eze Israel, dika Jehova kwuru, m'we wuere aha Jehova, bú Chineke Israel, ulo, 11 dọba ib͕e ahu n'ebe ahu, bú ib͕e nke ọb͕ub͕a-ndu Jehova di n'ebe ahu, bú ọb͕ub͕a-ndu nke Ya na umu Israel b͕ara. 12 O we guzo n'iru ebe-ichu-àjà Jehova n'iru nkpọkọta nile nke Israel, we b͕asa ọbu-aka-ya abua: 13 (n'ihi na Solomon mere ebe-nguzo di elu nke ọla-cubit ise ka ogologo-ya di, cubit ise ka obosara-ya di kwa, cubit atọ ka idi-elu, ya di kwa, o we tiye ya n'etiti ogige; o we guzo n'elu ya, b͕u ikperè-ya n'ala n'iru nkpọkọta nile nke Israel, b͕asa ọbu-aka-ya abua n'ebe elu-igwe di: ) 14 ọ si, Jehova, bú Chineke Israel, ọ dighi Chineke dika Gi, n'elu-igwe, ma-ọbu n'uwa; I nēdebere ndi-orù-Gi ọb͕ub͕a-ndu na ebere, bú ndi were obi-ha nile nējeghari n'iru Gi: 15 I debeworo orù-Gi Devid, bú nnam, ihe I gwara ya: I we were ọnu-Gi kwue, were kwa aka-Gi mezue ya, otú ọ di ta. 16 Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke Israel, debere orù-Gi Devid, bú nnam, okwu nke I gwaworo ya, si, Ọ dighi nwoke ọ bula i nwere agēbipu n'irum n'inọkwasi n'oche-eze Israel; nání ọ buru na umu-gi elezi uzọ-ha anya, ijeghari n'iwum dika i jeghariworo n'irum. 17 Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke Israel, ka okwu-Gi kwesi ntukwasi-obi, nke I gwara orù-Gi, bú Devid. 18 Ma ọ̀ bu ezie na Chineke gēbiyere madu n'elu uwa? le, elu-igwe na elu-igwe nke elu-igwe agaghi-anagide Gi; ulo a nke m'wuworo, ò gēsi kwa aṅa rue inagide Gi? 19 Ma che iru n'ekpere orù-Gi, na n'aririọ-amara-ya, Jehova, bú Chinekem, ige nti iti-nkpu na ekpere orù-Gi nēkpe n'iru Gi: 20 ka anya-Gi abua we nāsaghe n'ebe ulo a di ehihie na abali, bú n'ebe ebe ahu di nke I siworo na I gētiye aha-Gi n'ebe ahu; ige nti ekpere nke orù-Gi gēkpe n'ebe ebe a di. 21 Ge kwa nti aririọ-amara nile nke orù-Gi, na nke ndi-Gi, bú Israel, mb͕e ha nēkpe ekpere n'ebe ebe a di: Gi onwe-gi si kwa n'ebe obibi-Gi, bú site n'elu-igwe, nuru; mb͕e I nuworo, Gi b͕aghara kwa. 22 Ọ buru na nwoke emehie megide madu-ibe-ya, ewe tukwasi ya iyi ime ka ọ ṅua, iyi ahu we bia n'iru ebe-ichu-àjà-Gi n'ulo a: 23 Gi onwe-gi si kwa n'elu-igwe nuru, me kwa, kpe ndi-orù-gi ikpe, inyeghachi onye ikpe mara, itukwasi uzọ-ya n'isi-ya; na igu onye ezi omume n'onye ezi omume, inye ya dika ezi omume-ya si di. 24 Ọ buru kwa na etib͕ue ndi-Gi, bú Israel, n'iru onye-iro, n'ihi na ha nēmehie megide gi; ọ buru kwa na ha alaghachi, kwuputa aha-Gi, kpe ekpere, riọ amara n'iru Gi n'ulo a: 25 Gi onwe-gi si kwa n'elu-igwe nuru, b͕aghara nmehie ndi-Gi, bú Israel, me ka ha lata n'ala nke I nyere ha, nye kwa ndi bu nna-ha. 26 Mb͕e eb͕ochiri elu-igwe, mb͕e miri-ozuzo nādighi kwa, n'ihi na ha nēmehie megide Gi; ọ buru na ha ekpe ekpere n'ebe ebe a di, kwuputa aha-Gi, si na nmehie-ha laghachi, n'ihi na I nēweda ha n'ala: 27 Gi onwe-gi nuru kwa n'elu-igwe, b͕aghara nmehie ndi-orù-Gi, na nke ndi-Gi, bú Israel, n'ihi na I nēzí ha ezi uzọ nke ha ganēje ije nime ya; Gi me kwa ka miri zokwasi ala-Gi, nke I nyeworo ndi-Gi ibu ihe-nketa. 28 Mb͕e oké unwu gādi n'ala, mb͕e ajọ ọria nke nēfe efe gādi, mb͕e nchakpọ gādi, ma-ọbu ọmuma-ebu, ma-ọbu igurube, ma-ọbu ọbubu; mb͕e ndi-iro-ha gānọchigide ha n'agha n'ala nke ọnu-uzọ-ama nile ha; ihe-otiti ọ bula, ma-ọbu ọria ọ bula; 29 ekpere ọ bula, aririọ-amara ọ bula, nke gādiri madu ọ bula, ma-ọbu nke gādiri ndi-Gi nile, bú Israel, ndi gāmara, nwoke ọ bula ihe-otiti-ya na ihe-nb͕u-ya, o we b͕asa ọbu-aka-ya abua n'ebe ulo a di: 30 Gi onwe-gi si kwa n'elu-igwe, bú ọnọdu obibi-Gi guzosiri ike, nuru, b͕aghara, nye nwoke ọ bula dika uzọ-ya nile si di, onye I mara obi-ya; (n'ihi na Gi onwe-gi amawo obi umu madu, nání Gi; ) 31 ka ha we tua egwu Gi, ije ije n'uzọ-Gi nile, ubọchi nile nke ha onwe-ha nēbi n'elu ala ahu nke I nyere nna-ayi-hà. 32 Ọzọ kwa, ihe bayere onye ala ọzọ, nke ọ bughi na ndi-Gi, bú Israel, ka o sitere, ma o siwo n'ala di anya bia n'ihi aha uku Gi, na aka-Gi di ike, na ogwe-aka-Gi esetiri eseti; mb͕e ha gābia kpe ekpere n'ebe ulo a di: 33 Gi onwe-gi si kwa n'elu-igwe, site n'ọnọdu obibi-Gi guzosiri ike, nuru, me dika ihe nile si di nke onye ala ọzọ ahu nākpọku Gi; ka ndi nile nke uwa we mara aha-Gi, itu egwu Gi, dika ndi-Gi, bú Israel, si eme, na imara na akpọkwasiri aha-Gi n'ulo a nke M'wuworo. 34 Mb͕e ndi-Gi gāpu ibuso ndi-iro-ha agha, n'uzọ ọ bula I gēziga ha, ha we kpere Gi n'uzọ obodo ahu nke I rọputaworo, na n'ebe ulo a di nke m'wuworo aha-Gi: 35 Gi si kwa n'elu-igwe nuru ekpere-ha na aririọ-amara-ha, mezie ikpé-ha. 36 Mb͕e ha gēmehie megide Gi, (n'ihi na ọ dighi madu ọ bula nke nādighi-emehie, ) I we wesa ha iwe, rara ha nye n'iru onye-iro-ha, ndi nādọta ha n'agha ewe dọta ha n'agha je n'ala di anya ma-ọbu nke di nso; 37 ha we chègharia n'obi-ha n'ala ebe adọtara ha n'agha, we chigharia, riọ Gi amara n'ala ndọta-n'agha-ha, si, Ayi emehiewo, me ajọ omume, mebie iwu-Gi; 38 ọ buru kwa na ha ewere obi-ha nile, were kwa nkpuru-obi-ha nile, laghachikute Gi n'ala ndọta-n'agha-ha, bú ebe ha dọtara ha n'agha, we kpe ekpere n'uzọ ala-ha, nke I nyere ndi bu nna-ha, na obodo ahu nke I rọputaworo, na n'ebe ulo nke m'wuworo aha-Gi di: 39 Gi si kwa n'elu-igwe, bú site n'ọnọdu obibi-Gi guzosiri ike, nuru ekpere-ha na aririọ-amara nile ha, mezie ikpé-ha; b͕aghara ndi-Gi ndi mehieworo megide Gi. 40 Ub͕u a, Chinekem, biko, ka anya-Gi abua nāsaghe, ka nti-Gi abua nāṅa kwa nti, n'ekpere nke ebe a. 41 Ma ub͕u a, bilie, Jehova, bú Chineke, ba n'ebe-izu-ike-Gi, Gi onwe-gi na ib͕e nke ike-Gi: Jehova, bú Chineke, ka ndi-nchu-àjà-Gi yiri nzọputa dika uwe, ka ndi-ebere-Gi ṅuri kwa ọṅu n'idi-nma. 42 Jehova, bú Chineke, echigharila iru onye-Gi etere manu; cheta ebere nile nke Devid, bú orù-Gi.

2 Ihe Emere 7

1 Ma mb͕e Solomon kpebìri ekpere, ọku siri n'elu-igwe ridata, we ripia àjà-nsure-ọku na àjà nile; ebube Jehova we juputa ulo ahu. 2 Ndi-nchu-àjà apughi kwa ibà n'ulo Jehova, n'ihi na ebube Jehova juputara ulo Jehova. 3 Umu Israel nile nēlekwasi kwa nrida ọku ahu anya, ya na ebube Jehova nke di n'elu ulo ahu; ha we ruru ala, kpuchie iru-ha n'ala n'elu pavement, kpọ isi ala, we kele Jehova, si, N'ihi na Ọ di nma; n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. 4 Eze na ndi Israel nile nāchu kwa àjà n'iru Jehova. 5 Eze, bú Solomon, we chua àjà, bú orú nnù ehi uzọ abua na nnù iri-na-ise, na orú nnù aturu uzọ iri-na-ise. Eze na ndi Israel nile we ra ulo Chineke nye Chineke. 6 Ndi-nchu-àjà nēguzo kwa, dika ihe-ndebe-ha si di; ha na ndi Livai, ndi chiri ihe abù Jehova, nke Devid, bú eze, mere ikele Jehova, n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di, mb͕e Devid nēto Chineke site n'aka-ha: ndi-nchu-àjà nāfù kwa opì n'iru ha; Israel nile nēguzo kwa. 7 Solomon we do etiti ogige nke di n'iru ulo Jehova nsọ; n'ihi na ọ churu àjà-nsure-ọku na abuba àjà-udo n'ebe ahu: n'ihi na ebe-ichu-àjà ọla nke Solomon mere apughi inagide àjà-nsure-ọku, na onyinye-inata-iru-ọma, na abuba ahu. 8 Solomon we me ememe na mb͕e ahu ubọchi asa, ya na Israel nile, oké nkpọkọta uku, site na nbata Hemat rue miri-iyi Ijipt. 9 Ha we me ememe nb͕ochi n'ubọchi nke-asatọ: n'ihi na ha mere ememe ira ebe-ichu-àjà nye Chineke ubọchi asa, me kwa ememe ahu ubọchi asa. 10 N'ubọchi nke-orú-na-atọ nke ọnwa nke-asa o we zilaga ndi Israel n'ulo-ikwū-ha, ha nāṅuri ọṅu, obi di kwa ha nma, n'ihi ezi ihe nke Jehova mere Devid, me-kwa-ra Solomon, me-kwa-ra Israel, bú ndi-Ya. 11 Solomon we wubìe ulo Jehova, na ulo eze: ma ihe nile nke batara n'obi Solomon ime n'ulo Jehova na n'ulo-ya, o mere ka ha ga nke-ọma. 12 Jehova we me ka Solomon hu Ya anya n'abali, Ọ si ya, Anuwom ekpere-gi, rọputa-kwa-ra Onwem ebe a ibu ulo ichu àjà. 13 Asi na eb͕ochim elu-igwe, miri-ozuzo we ghara idi, ma-ọbu asi na enyem igurube iwu iripia ala, ma-ọbu asi na ezitem ajọ ọria nēfe efe n'etiti ndim; 14 ọ buru na ndim, bú ndi akpọkwasiri ha aham, eweda onwe-ha n'ala, kpe ekpere, chọ irum, si n'uzọ ọjọ ha nile laghachi; Mu onwem gēsi kwa n'elu-igwe nuru, b͕aghara ha nmehie-ha, me ka ala-ha diri ndu. 15 Ub͕u a anyam abua ganāsaghe, ntim abua ganāṅa kwa nti, n'ekpere nke ebe a. 16 Ma ub͕u a arọputawom ulo a, do kwa ya nsọ, ka aham we di n'ebe ahu rue mb͕e ebighi-ebi: anyam abua na obim gādi kwa n'ebe ahu ubọchi nile. 17 Ma gi onwe-gi, ọ buru na i jegharia n'irum, dika Devid, bú nna-gi, jeghariri, ọbuná ime dika ihe nile si di nke M'nyeworo gi n'iwu, ọ buru na i debe ukpurum nile na ikpém nile; 18 M'gēme kwa ka oche-eze ala-eze-gi guzosie ike, dika Mu na Devid, bú nna-gi, b͕ara ndu, M'we si, Ọ dighi nwoke ọ bula i nwere agēbipu n'ichi Israel. 19 Ma ọ buru na unu onwe-unu alaghachi azu, we rapu ukpurum nile na ihe nile M'nyere n'iwu, nke M'tiyeworo n'iru unu, unu we je fè chi ọzọ òfùfè, kpọ isi ala nye ha: 20 M'gēropu kwa ha n'elu alam nke M'nyeworo ha; M'gēsi kwa n'irum tupu ulo a, nke M'doworo nsọ nye aham, M'gēme kwa ya ilu na ihe-àkùkù n'etiti ndi ọzọ nile. 21 Ulo a kwa, nke kachasi elu, o gēju onye ọ bula nke nāgabiga ya anya, ọ gāsi kwa, N'ìhi gini ka Jehova meworo ala nka na ulo a otú a? 22 Ha gāsi kwa, Ọ bu n'ihi na ha rapuru Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, Onye mere ka ha si n'ala Ijipt puta, ha we jide chi ọzọ, kpọ isi ala nye ha, fè ha òfùfè: n'ihi ya ka O meworo ka ihe ọjọ a nile biakwasi ha.

2 Ihe Emere 8

1 O rue, n'ọgwugwu orú arọ, nke Solomon wuru ulo Jehova na ulo-ya nime ha, 2 na obodo nile nke Huram nyere Solomon, Solomon we wue ha, me ka umu Israel biri n'ebe ahu. 3 Solomon we jerue Hemat-zoba, were ya. 4 O we wue Tadmoa n'ọzara, na obodo nile nke nchikọbata-ihe, nke o wuru na Hemat. 5 O wu-kwa-ra Bet-horon di n'elu, na Bet-horon di n'okpuru, bú obodo ewusiri ike, nke nwere mb͕idi, na ibo-ọnu-uzọ-ama siri ike, na nkpọrọ; 6 na Bealat, na obodo nile nke nchikọbata-ihe nke Solomon nwere, na obodo nile nke ub͕ọ-ala-ya, na obodo nile nke ndi-inyinya-ya, na ihe nile di Solomon ezi nma n'obi, bú nke di ya ezi nma n'obi iwu na Jerusalem, na nime Lebanon, na n'ala nile ọ nāchi. 7 Ma ndi nile fọduru n'etiti ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus, ndi nēsiteghi n'Israel; 8 site n'umu-ha ndi fọduru inọchi ha n'ala, ndi umu Israel nēmeghi ka ha gwusia, Solomon we si nime ha weputa usu ndi nēfè òfùfè, rue ta. 9 Ma Solomon emeghi ndi-orù site n'umu Israel ije ozi-ya; kama ndi ahu bu ndikom agha, na ndi-isi ndi-ọchi-agha-ya, na ndi-isi ub͕ọ-ala-ya na ndi-inyinya-ya. 10 Ndia bu kwa ndi-isi nke ndi ahu edoro ndi-isi, ndi Solomon nwere, ọgu madu iri-na-abua na iri, ndi nwere ike n'aru ndi ahu. 11 Solomon we me ka nwa-nwayi Fero si n'obodo Devid rigorue ulo ahu nke o wuru nye ya: n'ihi na ọ siri, Nwunye m'nwere agaghi-ebi n'ulo Devid, bú eze Israel, n'ihi na ebe nile di nsọ, bú nke ib͕e Jehova bataworo nime ha. 12 Mb͕e ahu Solomon surere àjà-nsure-ọku nye Jehova n'elu ebe-ichu-àjà Jehova, nke O wuru n'iru uzọ-nbata, 13 ọbuná dika ihe ubọchi si di n'ubọchi-ya, n'isure àjà-nsure-ọku dika ihe Moses nyere n'iwu si di, n'ubọchi-izu-ike nile, na n'ọnwa ọhu nile, na na mb͕e nile akara àkà, ub͕ò atọ n'arọ, bú n'ememe achicha ekoghi-eko, na n'ememe nke izù asa nke ubọchi asa, na n'ememe ulo-ntu. 14 Dika ikpé Devid, bú nna-ya, si di, o we guzo òkè nile nke ndi-nchu-àjà bayere òfùfè-ha, na ndi Livai bayere ihe-ndebe nile ha, ito Chineke, na ije ozi n'iru ndi-nchu-àjà, ime ihe ubọchi n'ubọchi-ya: o guzo-kwa-ra ndi-ọnu-uzọ-ama n'òkè nile ha n'ọnu-uzọ-ama ọ bula: n'ihi na otú a ka ihe si di nke Devid, bú onye nke Chineke, nyere n'iwu. 15 Ma ha ewezugaghi onwe-ha n'ihe eze nyere ndi-nchu-àjà na ndi Livai n'iwu bayere ihe ọ bula, baye-kwa-ra àkù nile. 16 Ewe dozie ije-ozi nile nke Solomon rue ubọchi atọrọ ntọ-ala ulo Jehova, ru kwa mb͕e ewubìri ya. Ewuzuru ulo Jehova. 17 Mb͕e ahu Solomon jeruru Ezion-geba, ru kwa Ilot, n'usọ oké osimiri, n'ala Edom. 18 Huram we zitere ya ub͕ọ na ndi-orù ndi mara oké osimiri n'aka ndi-orù-ya; ha na ndi-orù Solomon we biarue Ofia, si n'ebe ahu weta nnù talent ọla-edo na ọgu abua na iri, wetara eze, bú Solomon.

2 Ihe Emere 9

1 Ma eze-nwayi Sheba nuru akukọ Solomon, we bia iwere ilu di iche iche nwa Solomon nime Jerusalem, ya na usu di ọtutu nke-uku, na camel nēbu uda di iche iche, na ọla-edo n'uba, na nkume di oké ọnu-ahia: o we biakute Solomon, kpayere ya uka nile nke di ya n'obi. 2 Solomon we gosi ya okwu-ya nile: ọ dighi kwa okwu ọ bula ezonariri Solomon nke ọ nēgosighi ya. 3 Eze-nwayi Sheba we hu amam-ihe Solomon, na ulo nke o wuru, 4 na ihe-oriri nke table-ya, na nnọdu nke ndi-orù-ya, na nguzo nke ndi nējere ya ozi, na uwe-ha; na ndi-obu-ihe-ọṅuṅu-ya, na uwe-ha; na nrigo-ya nke ọ nārigo n'ulo Jehova; mọ adighi kwa nime ya ọzọ. 5 O we si eze, Ezi-okwu ka ọ bu, bú okwu nke m'nuru n'alam bayere okwu-gi nile, baye-kwa-ra amam-ihe-gi. 6 Ma ekweghm okwu nile ha, rue mb͕e m'biara, anyam abua we hu ya: ma, le, egosighm nkera uba amam-ihe-gi: i tukwasiwo ihe n'akukọ nke m'nuru. 7 Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndikom-i bu, ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi-orù-gi ndia bu, ndi nēguzo n'iru gi mb͕e nile, ndi nānu amam-ihe-gi. 8 Ka Jehova, bú Chineke-gi, buru onye agọziri agọzi, Onye ihe-gi tọrọ Ya utọ, itiyekwasi gi n'oche-eze-Ya, iburu Jehova, bú Chineke-gi, eze: n'ihi na Chineke-gi huru Israel n'anya, ime ka ha guzo rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi ya ka O mere gi eze-ha, ime ihe ekpere n'ikpe na ezi omume. 9 O nye eze ọgu talent ọla-edo isi, na uda di iche iche n'uba nke-uku, na nkume di oké ọnu-ahia: ọ dighi uda di ka uda ahu nke eze-nwayi Sheba nyere eze, bú Solomon. 10 Ọzọ kwa, ndi-orù Huram, na ndi-orù Solomon, ndi siri n'Ofia bubata ọla-edo, bubatara osisi algum na nkume di oké ọnu-ahia. 11 Eze we were osisi algum ahu mere ulo Jehova, me-kwa-ra ulo eze, ebe-njeghari di elu, o were kwa ha mere ndi nābù abù ubọ-akwara na une: akāhughi osisi dika osisi ahu n'ala Juda. 12 Eze, bú Solomon, nye-kwa-ra eze-nwayi Sheba ihe nile nātọ ya utọ, ihe ọ bula ọ riọrọ, nāgughi ihe o butere eze. O we chigharia, la n'ala-ya, ya onwe-ya na ndi-orù-ya. 13 Ma ọtùtù ọla-edo nke biakutere Solomon n'otù arọ di nnù talent ọla-edo na ọgu iri-na-atọ na isi; 14 nāgughi ihe ndikom ndi nējeghari izu ahia na ndi-ahia wetara: eze nile nke Arebia na ndi nāchi ala nēweta-kwa-ra Solomon ọla-edo na ọla-ọcha. 15 Eze, bú Solomon, we me ọgu ọta uku iri, ha bu ọla-edo etisara etisa: nnù Shekel ọla-edo etisara etisa na ọgu iri bàra n'otù ọta uku. 16 O me-kwa-ra ọgu ọta iri-na-ise, ha bu ọla-edo etisara etisa; ọgu shekel ọla-edo iri-na-ise bàra n'otù ọta: eze we tiye ha n'ulo oké ọhia Lebanon. 17 Eze me-kwa-ra oké oche-eze nnọdu ọdu, machita ya ọla-edo anāgwaghi agwa. 18 Oche-eze ahu nwere ihe-nrigo isi, na ihe-nb͕akwasi-ukwu eji ọla-edo me, ejikọrọ ha na oche-eze ahu, aka di kwa n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ n'elu ebe ọnọdu-ya, ọdum abua nēguzo kwa n'akuku aka ahu. 19 Ọdum iri na abua we nēguzo n'ebe ahu n'elu ihe-nrigo isi ahu n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ: emeghi ya otú a nye ala-eze ọ bula. 20 Ihe nile eze, bú Solomon, nwere, bú nke eji aṅu ihe, bu ọla-edo, ihe nile nke ulo oké ọhia Lebanon bu kwa ọla-edo makarisiri nma: agughi ọla-ọcha n'ihe ọ bula n'ubọchi Solomon. 21 N'ihi na eze nwere ub͕ọ-nke nējeru Tashish nēso ndi-orù Huram: otù ub͕ò n'arọ atọ ka ub͕ọ Tashish nābia, nēbute ọla-edo, na ọla-ọcha, na ọdu, na enwe, na ekwuru-ulo. 22 Eze, bú Solomon, we di uku kari eze nile nke uwa n'àkù na amam-ihe. 23 Eze nile nke uwa we nāchọ iru Solomon, inu amam-ihe-ya, nke Chineke tiyere n'obi-ya. 24 Ndi ahu nēbute kwa, nwoke ọ bula onyinye-inata-iru-ọma-ya, ihe ọla-ọcha, na ihe ọla-edo, na uwe, na ihe-ekike-agha, na uda di iche iche, na inyinya, na inyinya mule, ihe anēnye n'arọ n'arọ-ya. 25 Solomon nwe-kwa-ra nnù ulo iri nke inyinya na ub͕ọ-ala, na orú nnù ndi-inyinya na nnù iri, o we do ha n'obodo ub͕ọ-ala nile, na n'ebe eze nọ na Jerusalem. 26 O we nāchi eze nile site n'Osimiri rue ala ndi Filistia, ru kwa ókè-ala Ijipt. 27 Eze we me ọla-ọcha ka ọ di ka nkume nime Jerusalem, o me-kwa-ra osisi cedar ka ha di ka osisi sycomore nke di n'ebe di ala ala n'uba. 28 Anēme kwa ka inyinya si n'Ijipt, si kwa n'ala nile, putara Solomon. 29 Ma ihe nile Solomon mere nke fọduru, nke-mbu na nke-ikpe-azu, èdeghi ihe ndia n'akwukwọ ihe emere nke Netan, bú onye-amuma, na n'obubu-amuma nke Ahaija, bú onye Shailo, na n'ọhù nile nke Ido, bú onye-ọhu-uzọ, bayere Jeroboam nwa Nebat? 30 Solomon we buru eze Israel nile nime Jerusalem ọgu arọ abua. 31 Solomon we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'obodo Devid, bú nna-ya: Rehoboam nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

2 Ihe Emere 10

1 Rehoboam we jerue Shekem: n'ihi na Shekem ka Israel nile biaruru ime ya eze. 2 O rue, mb͕e Jeroboam nwa Nebat nuru ya, (ma onye ahu nọ n'Ijipt, ebe o siri n'iru Solomon, bú eze, b͕alaga, ) na Jeroboam siri n'Ijipt lata. 3 Ha we ziga, kpọ ya; Jeroboam na Israel nile we bia, gwa Rehoboam okwu, si, 4 Nna-gi mere yoke-ayi ka o sie ike: ma ub͕u a me ka ọ di nfe kari, bú òfùfè siri ike nke nna-gi, na yoke-ya di arọ́ nke ọ tukwasiri ayi, ayi gēfè kwa gi òfùfè. 5 Ọ si ha, Mb͕e ubọchi atọ gasiri unu laghachikutekwam. Ndi Israel we la. 6 Eze, bú Rehoboam, we me ka ndi-okenye dua ya ọdu, bú ndi nēguzo n'iru Solomon nna-ya mb͕e ọ nọ na ndu, si, Ùnu onwe-unu si aṅa nādu ọdu iweghachiri ndi nka okwu? 7 Ha we gwa ya okwu, si, Ọ buru na i ghọrọ ndi nka onye ọma, ihe-ha we tọ gi utọ, i we gwa ha okwu di nma, ha gāghọ-kwa-ra gi orù ubọchi nile. 8 Ma ọ rapuru idu-ọdu nke ndi-okenye, nke ha nādu ya, o me ka umu-okorọbia dua ya ọdu, bú ndi ya na ha tokọzuru okè, ndi nēguzo n'iru ya. 9 Ọ si ha, Gini ka unu onwe-unu nādu ọdu, ka ayi we weghachiri ndi nka okwu, bú ndi gwaworom okwu, si, Me ka ọ di nfe kari, bú yoke nke nna-gi tukwasiri ayi? 10 Umu-okorọbia ndi ya na ha tokọzuru okè we gwa ya okwu, si, Otú a ka i gāsi ndi nka, ndi gwara gi okwu, si, Nna-gi mere yoke-ayi ka ọ di arọ́, ma gi onwe-gi me ka ọ di ayi nfe kari; otú a ka i gāsi ha, Nkpisi-aka nke-ntà nkem di okpotokpo kari úkwù nnam. 11 Ma ub͕u a nnam boro unu yoke di arọ́, ma mu onwem gātukwasi ihe na yoke-unu: nnam were utari dọ unu aka na nti, ma mu onwem gēwere akpi dọ unu aka na nti. 12 Jeroboam na ndi Israel nile we biakute Rehoboam n'ubọchi nke-atọ, dika eze kwuru, si, Laghachikutenum n'ubọchi nke-atọ. 13 Eze we za ha okwu ike; eze, bú Rehoboam, we rapu idu-ọdu nke ndi-okenye, 14 gwa ha okwu dika idu-ọdu nke umu-okorọbia si di, si, Nnam mere yoke-unu ka ọ di arọ́, ma mu onwem gātukwasi ihe na ya: nnam were utari dọ unu aka na nti, ma mu onwem gēwere akpi dọ unu aka na nti. 15 Eze we ghara ige ndi Israel nti; n'ihi na nchighari nka sitere n'aka Chineke, ka Jehova we me ka okwu-Ya guzosie ike, bú nke Ọ gwara Jeroboam nwa Nebat site n'aka Ahaija onye Shailo. 16 Israel nile we hu na eze egeghi ha nti, ndi Israel we weghachiri eze okwu, si, Òkè gini ka ayi nwere nime Devid? ọ dighi kwa ihe-nketa di nime nwa Jesi: lanu, nwoke ọ bula, n'ulo-ikwū-unu, Israel: ub͕u a le ulo-gi, Devid. Israel nile we la n'ulo-ikwū-ha. 17 Ma umu Israel ndi bi n'obodo nile nke Juda, Rehoboam we buru eze-ha. 18 Eze, bú Rehoboam, we ziga Hadoram, onye bu onye-isi usu ndi nēfè òfùfè; umu Israel we were nkume tub͕ue ya, o we nwua. Eze, bú Rehoboam, we b͕a onwe-ya ume irigo n'ubọ-ala-ya, ib͕alaga na Jerusalem. 19 Israel we jehie megide ulo Devid, rue ta.

2 Ihe Emere 11

1 Rehoboam we biarue Jerusalem, kpọkọta ulo Juda na Benjamin, orú nnù ndikom orú uzọ na abua na nnù iri, bú ndi arọputara arọputa, ndi nēbu agha, ibuso Israel agha, iweghachiri Rehoboam ala-eze: 2 Okwu Jehova we rue Shemaia nti, bú onye nke Chineke, si, 3 Gwa Rehoboam nwa Solomon, bú eze Juda, gwa kwa Israel nile di na Juda na Benjamin, okwu, si, 4 Otú a ka Jehova siri, Unu arigola, unu ebuso-kwa-la umu-nne-unu agha: laghachinu, nwoke ọ bula n'ulo-ya; n'ihi na n'ebe M'nọ ka ihe a siteworo. Ha we nu okwu Jehova, si n'ije imegide Jeroboam laghachi. 5 Rehoboam we biri na Jerusalem, wue obodo ufọdu ib͕ochi agha nime Juda. 6 O wue Bet-lehem, na Itam, na Tekoa, 7 na Bet-zua, na Soko, na Adulam, 8 na Gat, na Marisha, na Zif, 9 na Adoraim, na Lekish, na Azeka, 10 na Zora, na Ajalon, na Hebron, nke di na Juda na Benjamin, bú obodo ewusiri ike. 11 Ọ we me ka ebe nile ewusiri ike di ike, tiye ndi-ndú nime ha, na àkù, bú ihe-oriri, na manu, na manya-vine. 12 O tiye-kwa-ra ọta na ube n'obodo nile ọ bula, we me ka ha di ike ri nne. O we nwe Juda na Benjamin. 13 Ndi-nchu-àjà na ndi Livai ndi nọ n'Israel nile we si n'ókè-ala-ha nile guzo onwe-ha n'akuku ya. 14 N'ihi na ndi Livai rapuru ebe-ita-nri-anu nile ha na ihe-onwunwe-ha, we jerue Juda, jeru kwa Jerusalem: n'ihi na Jeroboam na umu-ya ndikom juru ha, ka ha ghara iburu Jehova ndi-nchu-àjà: 15 ọ we guzoro onwe-ya ndi-nchu-àjà idiri ebe di elu, na idiri nkpi, na idiri umu-ehi, nke o mere. 16 Site n'ebo nile nke Israel ndi nēnye obi-ha ichọ Jehova, bú Chineke Israel, so-kwa-ra ha bia na Jerusalem ichuru Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, àjà. 17 Ha we me ka ala-eze Juda di ike, ha b͕a kwa Rehoboam nwa Solomon ume, arọ atọ: n'ihi na ha jere ije n'uzọ Devid na Solomon arọ atọ. 18 Rehoboam we lutara onwe-ya nwunye, bú Mahalat nwa-nwayi Jerimot nwa Devid, na Abihail nwa-nwayi Elaiab nwa Jesi, 19 o we muara ya umu-ndikom; Jeush, na Shemaria, na Zaham. 20 Mb͕e ọ lusiri ya ọ luta-kwa-ra Meaka nwa-nwayi Absalom; o we muara ya Abaija, na Atai, na Ziza, na Shelomit. 21 Rehoboam we hu Meaka nwa Absalom n'anya kari ndinyom-ya nile na iko-ya ndinyom nile: (n'ihi na ndinyom iri na asatọ ka ọ lutara, nwe kwa ọgu iko-ndinyom atọ, o we mua orú umu-ndikom na asatọ na ọgu umu-ndinyom atọ). 22 Rehoboam we guzo Abaija nwa Meaka ibu onye-isi, ọbuná ibu onye-ndú n'etiti umu-nne-ya: n'ihi na ọ di n'obi-ya ime ya eze. 23 O nwe-kwa-ra nghọta, we me ka ufọdu nime umu-ya ndikom nile b͕asa rue ala nile nke Juda na Benjamin, rue obodo ọ bula ewusiri ike: o we nye ha nri n'uba. O we chọ ìgwè ndinyom.

2 Ihe Emere 12

1 O rue, mb͕e emere ka ala-eze Rehoboam guzosie ike, mb͕e ọ di kwa ike, na ọ rapuru iwu Jehova, ya na Israel nile. 2 O rue n'arọ nke-ise nke eze, bú Rehoboam, na Shaishak, bú eze Ijipt, rigotara imegide Jerusalem, (ọ bu n'ihi na ha mekpuru emekpu megide Jehova, ) 3 ya na nnù ub͕ọ-ala atọ na orú nnù ndi-inyinya uzọ asa na nnù iri: ndi soro ya si n'Ijipt bia enweghi kwa ọnu-ọgugu; bú ndi-Lubim, na ndi-Sukim, na ndi Etiopia. 4 O we were obodo nile ewusiri ike nke Juda nwere, we biarue Jerusalem. 5 Ma Shemaia, bú onye-amuma, biakutere Rehoboam na ndi-isi Juda, ndi achikọtara rue Jerusalem n'ihi Shaishak, ọ si ha, Otú a ka Jehova siri, Unu onwe-unu arapuwom, ọzọ kwa, Mu onwem arapuwo unu n'aka Shaishak. 6 Ndi-isi Israel na eze we weda onwe-ha n'ala, si, Onye ezi omume ka Jehova bu. 7 Ma mb͕e Jehova huru na ha wedara onwe-ha n'ala, okwu Jehova ruru Shemaia nti, si, Ha ewedawo onwe-ha n'ala; M'gaghi-ebibi ha: kama M'gēnye ha nb͕apu na mb͕e ntà, agaghi-awusi kwa ọnumam na Jerusalem site n'aka Shaishak. 8 Otú ọ di, ha gāburu ya orù; ka ha we mara òfùfèm, na òfùfè ala-eze nke ala ọzọ. 9 Shaishak, bú eze Ijipt, we rigota imegide Jerusalem, we wepu àkù nile nke ulo Jehova na àkù nile nke ulo eze; ha nile ka o wepuru: o wepu-kwa-ra ọta ọla-edo nile nke Solomon mere. 10 Eze, bú Rehoboam, we me ọta ọla n'ọnọdu ha, nye ha n'aka ndi-isi ndi-ọb͕a-ọsọ, bú ndi nēche ọnu-uzọ ulo eze, ka ha lekọta ha anya. 11 O rue, mb͕e ọ bula eze nābà n'ulo Jehova, na ndi-ọb͕a-ọsọ biara we būru ha, bughachi kwa ha n'ime-ulo ndi-ọb͕a-ọsọ. 12 Ma mb͕e o wedara onwe-ya n'ala, iwe Jehova siri n'aru ya chigharia, O we ghara ibibizu ya: ọzọ kwa, ezi ihe ufọdu di na Juda. 13 Eze, bú Rehoboam, we me onwe-ya ka ọ di ike na Jerusalem, o we buru eze: n'ihi na Rehoboam b͕ara ọgu arọ abua na otù mb͕e ọ malitere ibu eze, o we buru eze arọ iri-na-asa na Jerusalem, bú obodo ahu nke Jehova rọputara n'ebo nile nke Israel, ido aha-Ya n'ebe ahu: aha nne-ya bu Neama nwayi Amon. 14 O we me ihe ọjọ, n'ihi na o dozighi obi-ya ichọ Jehova. 15 Ma ihe nile Rehoboam mere, nke-mbu na nke-ikpe-azu, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere nke Shemaia, bú onye-amuma, na n'akwukwọ Ido, bú onye-ọhu-uzọ, bayere akwukwọ-osuso-ọmumu? Ma agha di n'etiti Rehoboam na Jeroboam ubọchi nile. 16 Rehoboam we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'obodo Devid: Abaija nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

2 Ihe Emere 13

1 N'arọ nke iri-na-asatọ nke eze, bú Jeroboam, ka Abaija malitere ibu eze Juda. 2 Arọ atọ ka ọ bu eze na Jerusalem: aha nne-ya bu Maikaīa nwa-nwayi Uriel nke Gibea. Agha di kwa n'etiti Abaija na Jeroboam. 3 Abaija we were usu-ndi-agha, bú ndi-dike n'agha, bū agha, bú orú nnù ndikom ọgu uzọ abua na uzọ iri, bú ndi arọputara arọputa: ma Jeroboam were orú nnù ndikom ọgu uzọ ise, bú ndi arọputara arọputa, do agha n'usoro imegide ya, ha bu ndi-dike bu dìnkpà. 4 Abaija we bilie n'elu ugwu Zemaraim, nke di n'ugwu Efraim, si, Nurunum, Jeroboam na Israel nile; 5 ọ̀ bughi ọlu-unu imara na Jehova, bú Chineke Israel, nyere Devid ala-eze ibu onye-isi Israel rue mb͕e ebighi-ebi, ọbuná ya na umu-ya, n'ọb͕ub͕a-ndu nnú? 6 Ma Jeroboam nwa Nebat, bú orù Solomon nwa Devid, ebiliwo, we nupu isi imegide onye-nwe-ya. 7 Ndikom efu, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, we chikọta onwe-ha n'ebe ọ nọ, b͕a onwe-ha ume imegide Rehoboam nwa Solomon, ma Rehoboam bu nwata di kwa nrò n'obi, o meghi kwa onwe-ya ka ọ di ike n'iru ha. 8 Ma ub͕u a unu onwe-unu nāsi na unu gēme onwe-unu ka unu di ike n'iru ala-eze Jehova n'aka umu Devid; unu onwe-unu bu kwa ìgwè bara uba, n'etiti unu ka umu-ehi ọla-edo di kwa, bú nke Jeroboam mere nye unu ibu chi. 9 Ùnu akwapughi ndi-nchu-àjà Jehova, bú umu Eron, na ndi Livai, mere onwe-unu ndi-nchu-àjà dika ndi ala ọzọ nēme? onye ọ bula nke nābia iwere nwa oke-ehi na ebulu asa meju aka-ya, ọ gāghọ-kwa-ra ndi nābughi Chineke onye-nchu-àjà. 10 Ma ayi onwe-ayi, Jehova bu Chineke-ayi, ayi arapughi kwa Ya; ndi-nchu-àjà nēje-kwa-ra Jehova ozi, bú umu Eron, ndi Livai nọ kwa n'ije-ozi-ha: 11 ha nēsure-kwa-ra Jehova àjà-nsure-ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ kwa-ututu kwa-anyasi, ya na ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda di iche iche me: achicha edoro n'usoro di kwa n'elu table ahu di ọcha: ihe-idọba-oriọna nke ọla-edo na oriọna-ya nile di kwa, inwu enwu kwa-anyasi: n'ihi na ayi onwe-ayi nēdebe ihe-ndebe Jehova, bú Chineke-ayi; ma unu onwe-unu arapuwo Ya. 12 Ma, le, Chineke nọyere ayi, dika onye-isi-ayi, Ya na ndi-nchu-àjà-Ya, ndi chiri opì ahu, bú nke eji fù ka ha we dasie udà ike, ifù ha ka ha we dasie uda ike megide unu. Umu Israel, unu ebusola Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, agha; n'ihi na ọ gaghi-agara unu nke-ọma. 13 Ma Jeroboam mere ka ndi nēru nbì b͕a buruburu ibia n'azu ha: ha we di n'iru Juda, ma ndi nēru nbì di n'azu ha. 14 Juda we le anya n'azu, ma, le, anēbuso ha agha n'iru na azu: ha we tikue Jehova nkpu, ndi-nchu-àjà nāfù kwa opì. 15 Ndikom Juda we tie nkpu: o rue, mb͕e ndikom Juda tiri nkpu, na Chineke tib͕uru Jeroboam na Israel nile n'iru Abaija na Juda. 16 Umu Israel we si n'iru Juda b͕alaga: Chineke we nye ha n'aka-ha. 17 Abaija na ndi-ya we tib͕ue ha ọtutu ntib͕u: orú nnù ndi eb͕uru eb͕u ọgu uzọ atọ na uzọ abua na nnù iri, bú ndi arọputara arọputa, we dapu n'Israel. 18 Ewe weda umu Israel n'ala na mb͕e ahu, umu Juda we b͕a ume, n'ihi na ha dabere na Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha. 19 Abaija we chuso Jeroboam, nara ya obodo, bú Bet-el na umu-obodo-ya, na Jeshana na umu-obodo-ya, na Efron na umu-obodo-ya. 20 Jeroboam enweghi kwa ike ọzọ n'ubọchi Abaija: Jehova we tib͕ue ya, o we nwua. 21 Abaija we me onwe-ya ka ọ di ike, o we lutara onwe-ya ndinyom iri na anọ, mua orú umu-ndikom na abua, na umu-ndinyom iri na isi. 22 Ma ihe nile Abaija mere nke fọduru, na uzọ-ya nile, na okwu-ya nile, edewo ha n'akukọ Ido, bú onye-amuma.

2 Ihe Emere 14

1 Abaija we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, ha we lìe ya n'obodo Devid: Esa nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya: ala di jū n'ubọchi-ya arọ iri. 2 Esa we me ezi ihe nke zi-kwa-ra ezi n'anya Jehova, bú Chineke-ya: 3 o we wezuga ebe-ichu-àjà nile nke ala ọzọ, na ebe nile di elu, tupia ogidi nile, b͕utue Asherim; 4 ọ si Juda ka ha chọ Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, na ime iwu na ihe enyere n'iwu. 5 O si-kwa-ra n'obodo nile nke Juda wezuga ebe nile di elu na arusi-anyanwu nile: ala-eze-ya we di jū n'iru ya. 6 O we wue obodo ewusiri ike nime Juda: n'ihi na ala di jū, ọ dighi kwa agha o nwere n'arọ ndia; n'ihi na Jehova mere ka o zuru ike. 7 O we si Juda, Ka ayi wue obodo ndia, were mb͕idi, na ulo-elu, na ibo-ọnu-uzọ-ama, na nkpọrọ b͕a ha buruburu; ala-ayi di n'iru ayi rue ub͕u a, n'ihi na ayi achọwo Jehova, bú Chineke-ayi; ayi achọwo Ya, O we me ka ayi zuru ike buruburu. Ha we wue, ihe we gara ha nke-ọma. 8 Esa nwe-kwa-ra usu-ndi-agha ndi nēbu ọta uku na ube, orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ iri-na-asa na nnù iri ndi sitere na Juda; na orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ iri-na-ise ndi sitere na Benjamin, bú ndi nēbu ọta, nāzọgide kwa uta ikwe ha: ndia nile bu ndi-dike bu dìnkpà. 9 Zera, bú onye Etiopia, we chiri usu-ndi-agha, bú orú nnù ndikom ọgu uzọ isi na uzọ ise, na ọgu ub͕ọ-ala iri-na-ise, pukute ha; o we biarue Marisha. 10 Esa we pua izute ya, ha we do agha n'usoro nime ndagwuruguru Zefata nime Marisha. 11 Esa we kpọkue Jehova, bú Chineke-ya, si, Jehova, Ọ dighi onye tiyere Gi iye aka, n'etiti onye bara uba na onye ike nādigh: yere ayi aka, Jehova, bú Chineke-ayi; n'ihi na ọ bu na Gi ka ayi dabere, ọ bu kwa n'aha-Gi ka ayi biaworo imegide ìgwè a. Jehova, Chineke-ayi ka I bu; ekwela ka ihe akpọrọ madu b͕ochigide Gi. 12 Jehova we tib͕ue ndi Etiopia n'iru Esa, na n'iru Juda; ndi Etiopia we b͕alaga. 13 Esa na ndi ya na ha nọ we chua ha rue Gera: ọtutu nime ndi Etiopia we da, idebe-ndu we ghara idiri ha; n'ihi na etipiara ha n'iru Jehova na n'iru ọmuma-ulo-ikwū-Ya; ha we būru ihe-nkwata nke bara uba nke-uku. 14 Ha we tib͕ue obodo nile di Gera buruburu; n'ihi na oké egwu nke Jehova dakwasiri ha: ha we luta ihe obodo nile n'agha; n'ihi na ọtutu ihe-nluta-n'agha di nime ha. 15 Ọzọ kwa, ha tib͕uru ndi ulo-ikwū nke anu-ulo, we chiri n'agha ìgwè ewu na aturu n'uba na camel, lata na Jerusalem.

2 Ihe Emere 15

1 Mọ nke Chineke we dakwasi Azaraia nwa Oded: 2 o we pua izute Esa, si ya, Nurunum, Esa na Juda na Benjamin nile: Jehova nọyere unu, mb͕e unu nọyere Ya; ọ buru kwa na unu achọ Ya, Ọ gēme ka unu chọta Ya; ma ọ buru na unu arapu Ya, Ọ gārapu unu. 3 Ma ọtutu ubọchi ka Israel nọ nēnweghi Chineke nke ezi-okwu, nēnweghi kwa onye-nchu-àjà nēzí ihe, nēnweghi kwa iwu: 4 ha we chigharikute Jehova, bú Chineke Israel, nime nkpab͕u diri ha, we chọ Ya, O we me ka ha chọta Ya. 5 Ma na mb͕e ahu ọ dighi udo diri onye nāpu apu, ma-ọbu diri onye nābata abata, kama ọtutu ib͕a-aghara dikwasiri ndi nile bi n'ala ahu nile. 6 Ewe tipia ha, mba megide mba, na obodo megide obodo: n'ihi na Chineke were nkpab͕u nile chusa ha. 7 Ma unu onwe-unu, dinu ike, ekwela ka aka-unu kuda: n'ihi na ugwọ-ọlu diri ọlu-unu. 8 Ma mb͕e Esa nuru okwu ndia, na obubu-amuma nke Oded, bú onye-amuma, o mere onwe-ya ka ọ di ike, we me ka ihe-árú nile si n'ala Juda na Benjamin nile, si kwa n'obodo nile nke ọ naputara n'ugwu Efraim, gabiga; o me kwa ka ebe-ichu-àjà Jehova di ọhu, bú nke di n'iru uzọ-nbata Jehova. 9 Ọ chikọta Juda na Benjamin nile, na ndi nānọ dika ọbìa n'etiti ha site n'Efraim na Manase, site kwa na Simeon: n'ihi na ha siri n'Israel dayere ya n'uba, mb͕e ha huru na Jehova, bú Chineke-ya, nọyere ya. 10 Ha we chikọta onwe-ha nime Jerusalem n'ọnwa nke-atọ, n'arọ nke-iri-na-ise nke Esa bu eze. 11 Ha we chuara Jehova àjà n'ubọchi ahu, site n'ihe-nkwata ha bubatara, bú nnù ehi na ọgu iri-na-ise, na nnù aturu iri-na-asa na ọgu iri. 12 Ha we ba nime ọb͕ub͕a-ndu ahu, bú iwere obi-ha nile na nkpuru-obi-ha nile chọ Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha; 13 na ime ka onye ọ bula nwua, ma ọ bu onye ntà ma-ọbu onye uku, ma-ọbu nwoke ma-ọbu nwayi, nke nāchọghi Jehova, bú Chineke Israel. 14 Ha we were oké olu, were kwa iti-nkpu, were kwa opì, were kwa opì-ike, ṅuara Jehova iyi. 15 Juda nile we ṅuria ọṅu n'ọṅuṅu-iyi ahu: n'ihi na ha were obi-ha nile ṅua iyi, were kwa otú ọ nātọzu ha utọ chọ Ya; O we me ka ha chọta Ya: Jehova we me ka ha zuru ike buruburu. 16 Ọzọ kwa, Meaka nne Esa, bú eze, o wezugara ya n'ibu eze-nwayi, n'ihi na o mere ihe kpatara ima-jijiji nye Ashera; Esa we b͕utue ihe-ya kpatara ima-jijiji, ọ supia ya, sure ya ọku na miri-iyi Kidron. 17 Ma esighi n'Israel wezuga ebe di elu: otú ọ di, obi Esa zuru okè n'ubọchi-ya nile. 18 Ọ chibata n'ulo Jehova ihe nile nna-ya doro nsọ, na ihe nile ya onwe-ya doro nsọ, bú ọla-ọcha, na ọla-edo, na ihe di iche iche ọzọ. 19 Agha adighi kwa ọzọ rue arọ nke-orú-na-iri-na-ise nke Esa bu eze.

2 Ihe Emere 16

1 N'arọ nke-orú-na-iri-na-isi nke Esa bu eze, Beasha, bú eze Israel, we rigo imegide Juda, wue Rema, ka ọ ghara ikwe Esa, bú eze Juda, ka o nwe onye nāpu apu ma-ọbu onye nābata abata. 2 Esa we weputa ọla-ọcha na ọla-edo n'àkù ulo Jehova na nke ulo eze, zigara Ben-hedad, bú eze Siria, onye bi na Damaskọs, si, 3 Ọb͕ub͕a-ndu di n'etiti mu na gi, na n'etiti nnam na nna-gi: le, eziteworom i ọla-ọcha na ọla-edo; je, mebie ọb͕ub͕a-ndu gi na Beasha, bú eze Israel, b͕ara, ka o we si n'arum rigo. 4 Ben-hedad we ge eze, bú Esa, nti, zite ndi-isi usu nile nke ndi-agha o nwere imegide obodo nile nke Israel; ha we tib͕ue Ijon, na Dan, na Ebel-maim, na ulo-nchikọbata-ihe nile nke obodo Naftali nile. 5 O rue, mb͕e Beasha nuru ya, na ọ rapuru iwu Rema, me ka ozi-ya ahu kwusi. 6 Ma Esa, bú eze, chiri Juda nile; ha we bupu nkume nile nke Rema, na osisi-ya nile, nke Beasha ji wu ya; o we were ha wue Geba na Mizpa' 7 Ma na mb͕e ahu Hanani, bú onye-ọhu-uzọ, biakutere Esa, bú eze Juda, si ya, N'ihi na i dabeworo n'eze Siria, ma i dabeghi na Jehova, bú Chineke-gi, n'ihi nka usu-ndi-agha eze Siria esiwo n'aka-gi wepuga onwe-ya. 8 Ndi Etiopia na ndi-Lubim, hà abughi usu-ndi-agha n'uba, nēnwe ub͕ọ-ala na ndi-inyinya bara uba nke-uku? ma mb͕e i dabere na Jehova, O nyere ha n'aka-gi. 9 N'ihi na Jehova, anya-Ya nējeghari n'uwa nile, igosi Onwe-ya onye di ike n'akuku ndi obi-ha zuru okè n'ebe Ọ nọ. I bu onye-nzuzu na nka; n'ihi na site n'ub͕u a i gēnwe agha. 10 Esa we wesa onye-ọhu-uzọ ahu iwe, tiye ya n'ulo ọtọsi; n'ihi na o nēkosa ya ọnuma n'ihi ihe a. Esa we zọpia ufọdu nime ndi-ya na mb͕e ahu. 11 Ma, le, ihe nile Esa mere, nke-mbu na nke-ikpe-azu, le, edewo ha n'akwukwọ ndi-eze Juda na Israel. 12 Esa we ria ọria n'ukwu-ya abua n'arọ nke-orú-na-iri-na-iteghete ọ bu eze; ọria-ya di uku ri nne: ọzọ kwa, n'ọria-ya ọ chọghi Jehova, kama ọ chọrọ n'etiti ndi-dibia. 13 Esa we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, ọ nwua n'arọ nke-ọgu-abua-na-otú ọ bu eze. 14 Ha we lìe ya n'ili ya, nke o gwuwara nye onwe-ya n'obodo Devid, ha we me ka o dina n'ihe-ndina nke emejuru n'uda di iche iche na ihe di iche iche asugwara asugwa n'ọlu onye nāsugwa manu nēsì ísì utọ: ha we surere ya oké nsure-ọku di uku.

2 Ihe Emere 17

1 Jehoshafat nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya, we me onwe-ya ka ọ di ike imegide Israel. 2 O we tiye usu-ndi-agha n'obodo nile ewusiri ike nke Juda, o tiye-kwa-ra ebe-nguzo-ndi-agha n'ala Juda, na n'obodo Efraim nile nke Esa nna-ya were. 3 Jehova we nọyere Jehoshafat, n'ihi na o jere ije n'uzọ mbu Devid, bú nna-ya, ọ chọghi kwa Bealim; 4 kama ọ chọrọ Chineke nke nna-ya, jeghari kwa n'ihe nile O nyere n'iwu, ọ bughi kwa dika omume Israel si di. 5 Jehova we me ka ala-eze guzosie ike n'aka-ya; Juda nile we nye Jehoshafat onyinye-inata-iru-ọma; o we nwe àkù na nsọpuru n'uba. 6 Obi-ya di kwa elu n'uzọ nile nke Jehova: ọzọ kwa, o siri na Juda wezuga ebe nile di elu na Asherim. 7 Ma n'arọ nke-atọ nke ọ bu eze o zigara ndi-isi-ya, bú Ben-hail, na Obadaia, na Zekaraia, na Netanel, na Maikaia, izí ihe n'obodo Juda nile: 8 ha na ndi Livai, bú Shemaia, na Netanaia, na Zebadaia, na Asahel, na Shemiramot, na Jehonatan, na Adonaija, na Tobaija, na Tob-Adonaija, ndi Livai; ha na Elishama na Jehoram, bú ndi-nchu-àjà. 9 Ha we zí ihe na Juda, nēji akwukwọ iwu Jehova n'aka-ha; ha we nēje obodo nile nke Juda buruburu, we nēzí ihe n'etiti ndi Juda. 10 Oké egwu Jehova we dikwasi ala-eze nile nke ala nile nke di Juda buruburu, ha ebusoghi kwa Jehoshafat agha. 11 Ufọdu nime ndi Filistia weta-kwa-ra Jehoshafat onyinye-inata-iru-ọma, na ọla-ọcha òfùfè; ndi Arebia nēweta-kwa-ra ya ìgwè ewu na aturu, nnù ebulu iri-na-iteghete na ọgu ise, na nnù nkpi iri-na-iteghete na ọgu ise. 12 Jehoshafat we nāga n'iru we di ike ri nne; o we wue nime Juda ulo uku na obodo nchikọbata-ihe. 13 O nwe-kwa-ra ije-ozi bara uba n'obodo Juda nile, na ndikom agha nime Jerusalem, ha bu ndi-dike bu dìnkpà. 14 Ma ndia bu ngukọta-ha dika ulo nke ndi bu nna-ha si di: nke Juda, ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri; Adna, bú onye-isi, ya na orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ iri-na-asa na nnu iri, ndi-dike bu dìnkpà: 15 onye so ya bu Jehohanan, bú onye-isi, ya na orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ iri-na-ise: 16 onye so ya bu Amasaia nwa Zikri, onye were afọ-ofufo nye Jehova onwe-ya; ya na orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ ise, ndi-dike bu dìnkpà: 17 ndi sitere na Benjamin; otù dike bu dìnkpà, bú Elaiada, ya na orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ ise, ndi nāchi uta na ọta: 18 onye so ya bu Jehozabad, ya na orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ abua na nnù iri, ndi ejikere nke usu-ndi-agha. 19 Ndia bu ndi nējere eze ozi, nāgughi ndi ahu eze tiyere n'obodo nile ewusiri ike nime Juda nile.

2 Ihe Emere 18

1 Jehoshafat we nwe àkù na nsọpuru n'uba; o we ghọ ọgọ Ehab. 2 Mb͕e arọ ufọdu gwusiri ọ ridakuru Ehab, rue Sameria. Ehab we b͕uere ya aturu na ehi n'uba, b͕u-kwa-ra ndi ya na ha yikọrọ, o we kpalie ya irigoru Remot-gilead. 3 Ehab, bú eze Israel, we si Jehoshafat, bú eze Juda, Ì gēsom je Remot-gilead? Ọ we si ya, Dika m'di, otú a ka i di, ndim di kwa ka ndi-gi; ayi gānọye-kwa-ra gi n'agha ahu. 4 Jehoshafat we si eze Israel, Biko, buru uzọ ju ase okwu Jehova. 5 Eze Israel we chikọta ndi-amuma, bú nnù ndikom, si ha, Àyi gējeru Remot-gilead ibu agha, ma-ọbu #m'gārapu? Ha we si, Rigo; Chineke gēnye kwa ya n'aka eze. 6 Jehoshafat we si, Ọ̀ dighi onye-amuma Jehova nọ n'ebe a tiyere ndia, ka ayi we jua ase n'aka-ya? 7 Eze Israel we si Jehoshafat, Otù nwoke ọzọ di kwa iju Jehova ase n'aka-ya: ma mu onwem kpọrọ ya asì; n'ihi na ọ dighi-ebu amuma ezi ihe bayerem, kama nke ihe ọjọ ubọchi-ya nile: onye ahu bu Maikaia nwa Imla. Jehoshafat we si, Ka eze ghara ikwu otú a. 8 Eze Israel we kpọ otù onye nēje ozi, si, Me ka Maikaia nwa Imla bia ọsọsọ. 9 Ma eze Israel na Jehoshafat, bú eze Juda, nānọkwasi, nwoke ọ bula n'oche-eze-ya, yiri uwe-ha, ha we nọdu n'ebe-nzọcha-ọka n'oghere ọnu-uzọ-ama Sameria; ndi-amuma nile nēbu kwa amuma n'iru ha. 10 Zedakaia nwa Keneana we mere onwe-ya mpi ígwè, si, Otú a ka Jehova siri, Ndia ka i gēji sọ Siria, rue mb͕e agēme ka ha gwusia. 11 Ndi-amuma nile nēbu kwa amuma otú a, si, Rigorue Remot-gilead, ka ihe ga-kwa-ra gi nke-ọma: Jehova enyewo kwa ya n'aka eze. 12 Ma onye-ozi ahu nke jere ikpọ Maikaia gwara ya okwu, si, Le, okwu nile nke ndi-amuma, dika otù ọnu, nēkwuru eze ezi ihe: biko, ka okwu-gi di kwa ka okwu otù onye nime ha, gi kwu kwa ezi ihe. 13 Maikaia we si, Jehova nādi ndu, n'ezie ihe Chinekem gāsi, nke ahu ka m'gēkwu. 14 O we biakute eze, eze we si ya, Maikaia, àyi gējeru Remot-gilead ibu agha, ma-ọbu #m'gārapu? Ọ si, Rigonu, ka ihe ga-kwa-ra unu nke-ọma; agēnye kwa ha n'aka-unu. 15 Eze we si ya, Ùb͕ò ole ka mu onwem ganāb͕a gi iyi ka i ghara igwam ihe ọ bula ma-ọbughi ezi-okwu n'aha Jehova? 16 Ọ si, Ahurum Israel nile ka ha b͕asaworo n'ugwu, dika ìgwè aturu nēnweghi onye-ọzùzù: Jehova we si, Ọ dighi onye nwe ndia; ka ha laghachi, nwoke ọ bula n'ulo-ya n'udo. 17 Eze Israel we si Jehoshafat, Àsighm i na ọ gaghi-ebu amuma ezi ihe bayerem, kama nke ihe ọjọ? 18 Ọ si, N'ihi nka nurunu okwu Jehova: ahurum Jehova ka Ọ nānọkwasi n'oche-eze-Ya, na usu-ndi-agha nke elu-igwe nile ka ha nēguzo n'aka-nri-Ya na n'aka-ekpe-Ya. 19 Jehova we si. Ònye gārafu Ehab, bú eze Israel, ka o we rigo, da na Remot-gilead? Otù onye nke nēkwu okwu we si otú a, onye ọzọ nke nēkwu okwu si kwa otú a. 20 Mọ ahu we puta, guzo n'iru Jehova, si, Mu onwem gārafu ya. Jehova we si ya, Gini ka i gēji? 21 Ọ si, M'gāpu, buru mọ okwu-ugha n'ọnu ndi-amuma-ya nile. Ọ si, I gārafu ya, i gēnwe kwa ike: pua, me otú a. 22 Ma ub͕u a, le, Jehova etiyewo mọ okwu-ugha n'ọnu ndi-amuma-gi ndia; Jehova ekwuwo kwa ihe ọjọ bayere gi. 23 Zedekaia nwa Keneana we biarue nso, tie Maikaia aka na ǹtì, si, Òle uzọ Mọ Jehova siri n'ebe m'nọ gabiga igwa gi okwu? 24 Maikaia we si, Le, i ganāhu n'ubọchi ahu, mb͕e i gābà n'ime-ulo nke di n'ime-ulo izo onwe-gi. 25 Eze Israel we si, Kurunu Maikaia, me ka ọ laghachikuru Emon, bú onye-isi obodo, laghachikuru kwa Joash, bú nwa eze, 26 unu gāsi kwa, Otú a ka eze siri, Tiyenu onye a n'ulo-nkpọrọ, me ka o rie nri nmeb͕u, ṅu kwa miri nmeb͕u, rue mb͕e m'gālaghachi n'udo. 27 Maikaia we si, Ọ buru na i laghachi ma-ọli n'udo, Jehova ekwughi okwu n'ọnum. Ọ si, Nurunu, ndi nile n'uwa, unu nile. 28 Eze Israel na Jehoshafat, bú eze Juda, we rigorue Remot-gilead. 29 Eze Israel we si Jehoshafat, M'gēnwoghari onwem, ba n'agha; ma gi onwe-gi yikwasi uwe-gi. Eze Israel we nwogharia onwe-ya; ha we ba n'agha. 30 Ma eze Siria nyere ndi-isi ub͕ọ-ala o nwere iwu, si, Unu ebusola onye ntà ma-ọbu onye uku agha, kama ọ bu eze Israel, nání ya. 31 O rue, mb͕e ndi-isi ub͕ọ-ala huru Jehoshafat, na ha onwe-ha siri, Eze Israel ka ọ bu. Ha we chigharia ibuso ya agha: Jehoshafat we tie nkpu, Jehova we yere ya aka; Chineke we kpalie ha isi n'ebe ọ nọ pua. 32 O rue, mb͕e ndi-isi ub͕ọ-ala huru na ọ bughi eze Israel, ha we si n'iso ya laghachi. 33 Ma otù nwoke dọrọ uta-ya nāmaghi onye ọ bu, we b͕ata eze Israel n'etiti njikọ ihe-agha-ya na uwe-agha-ya: o we si onye-ub͕ọ-ala-ya, Chigharia aka-gi, me ka m'si n'ọmuma-ulo-ikwū pua; n'ihi na ọria nāriam. 34 Agha we la elu n'ubọchi ahu: eze Israel we guzogide onwe-ya n'ub͕ọ-ala-ya imegide Siria rue anyasi: ọ we nwua mb͕e anyanwu nāda.

2 Ihe Emere 19

1 Jehoshafat, bú eze Juda, we laghachi n'ulo-ya n'udo, rue Jerusalem. 2 Jihu nwa Hanani, bú onye-ọhu-uzọ, we pua izute ya, ọ si eze, bú Jehoshafat, Ò kwesiri gi iyere onye nēmebi iwu aka? ọ̀ bu kwa ndi nākpọ Jehova asì ka i nāhu n'anya? ma n'ihi ihe a iwe dikwasi gi site n'iru Jehova. 3 Otú ọ di, achọtawo ezi ihe n'aka-gi, n'ihi na i mewo ka Asherot si n'ala nka gabiga, i we dozie obi-gi ichọ Chineke. 4 Jehoshafat we biri na Jerusalem: o we jeghachi pua jegharia n'etiti ndi-ya site na Bia-sheba rue ugwu Efraim, me ka ha laghachikute Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha. 5 O we guzo ndi-ikpe n'ala-ya n'obodo nile ewusiri ike nke Juda, n'obodo n'obodo, 6 ọ si ndi-ikpe, Lenu ihe unu onwe-unu nēme: n'ihi na ọ bughi madu ka unu nēkpere ikpe, kama ọ bu Jehova; Ọ nọye-kwa-ra unu n'okwu ikpe-unu. 7 Ma ub͕u a ka oké egwu Jehova dikwasi unu; lezienu anya, me ya: n'ihi na ọ dighi ajọ omume, ma-ọbu ihu-madu-iru-ọma, ma-ọbu inara-ihe-iri-ngo, di nime Jehova, bú Chineke-ayi. 8 Ọzọ kwa, nime Jerusalem ka Jehoshafat guzoro ufọdu nime ndi Livai na ndi-nchu-àjà, na ufọdu nime ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke Israel, ikpe ikpe Jehova, na idozi ise-okwu. Ha we laghachi na Jerusalem. 9 O nye ha iwu, si, Otú a ka unu gēme n'egwu Jehova, na n'ikwesi-ntukwasi-obi, na n'obi zuru okè. 10 Ma mb͕e ise-okwu ọ bula gēru unu nti site n'umu-nne-unu ndi bi n'obodo-ha, n'etiti ọbara na ọbara, n'etiti iwu na ihe enyere n'iwu, na ukpuru na ikpé, unu gēme kwa ka ha ghọta, ka ikpe we ghara ima ha n'ebe Jehova nọ, iwe ewe dikwasi unu, dikwasi kwa umu-nne-unu: otú a ka unu gēme, ikpe agaghi-ama kwa unu. 11 Ma, le, Amaraia, bú onye-isi-nchu-àjà, bu onye-isi-unu n'okwu ọ bula nke Jehova; Zebadaia nwa Ishmael, bú onye-ndú ulo Juda, bu onye-isi-unu n'okwu ọ bula nke eze: ndi Livai gābu kwa ndi-odozi-okwu n'iru unu. Dinu ike, me; ka Jehova nọye-kwa-ra ezi madu.

2 Ihe Emere 20

1 O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na umu Moab, na umu Amon, ha na ufọdu site na ndi ọzọ, biara imegide Jehoshafat n'agha. 2 Madu ufọdu we bia gosi Jehoshafat, si, Ìgwè madu bara uba esiwo n'ofè oké osimiri, site na Siria, bia imegide gi; ma, le, ha nọ nime Hazazon-tema (nke bu En-gedi). 3 Jehoshafat we tua egwu, che iru-ya ichọ Jehova; o we kpọsa obubu-ọnu na Juda nile. 4 Juda we chikọta onwe-ha ichọ iye-aka site n'aka Jehova: ọbuná site n'obodo nile nke Juda ka ha biara ichọsi Jehova ike. 5 Jehoshafat we guzo nime nkpọkọta Juda na Jerusalem, n'ulo Jehova, n'iru ogige ọhu; 6 ọ si, Jehova, bú Chineke nke nna-ayi-hà, ọ̀ bughi Gi onwe-gi bu Chineke n'elu-igwe? ọ̀ bughi Gi onwe-gi nāchi kwa ala-eze nile nke mba nile? ọ bu kwa n'aka-Gi ka ume na idi-ike di, ọ dighi kwa onye gēguzo onwe-ya n'ebe I nọ. 7 Ọ̀ bughi Gi onwe-gi, Chineke-ayi, napuru ndi bi n'ala nka ala-ha n'iru ndi-Gi, bú Israel, were ya nye nkpuru Abraham, bú onye nāhu Gi n'anya, rue mb͕e ebighi-ebi? 8 Ha we biri nime ya, wuere Gi ebe nsọ nime ya nye aha-Gi, si, 9 Ọ buru na ihe ọjọ abiakwasi ayi, bú mma-agha ikpé, ma-ọbu ajọ ọria nēfe efe, ma-ọbu oké unwu, ayi gēguzo n'iru ulo a, na n'iru Gi, (n'ihi na aha-Gi di n'ulo a, ) si na nkpab͕u-ayi tikue Gi, I gānu kwa, zọputa. 10 Ma ub͕u a, le, umu Amon na Moab na ugwu Sia, ndi I nēkweghi Israel ka ha bakuru ha, mb͕e ha nēsi n'ala Ijipt bia, kama ha si n'ebe ha nọ wezuga onwe-ha, ha ekpochapughi kwa ha; 11 ma, le, otú ndi ahu nēnyeghachi ayi, n'ibia ichupu ayi n'ihe-nnweta-Gi, nke I meworo ka ayi nweta. 12 Chineke-ayi, Ì gaghi-ekpe ha ikpe? n'ihi na ike adighi nime ayi n'iru ìgwè madu a bara uba nke nābia imegide ayi; ayi onwe-ayi amaghi kwa ihe ayi gēme: kama ọ bu Gi ka anya-ayi nādikwasi. 13 Juda nile nēguzo kwa n'iru Jehova, ha na umu-ntakiri-ha, na ndinyom-ha, na umu-ha. 14 Ma Mọ Jehova dikwasiri Jahaziel nwa Zekaraia, nwa Benaia, nwa Jeiel, nwa Matanaia, bú onye Livai, onye sitere n'umu Esaf, n'etiti nkpọkọta ahu; 15 ọ si, Ṅanu nti, Juda nile, na ndi bi na Jerualem, na eze-ayi, bú Jehoshafat, otú a ka Jehova siri unu, Unu onwe-unu atula egwu, unu atu-kwa-la ujọ n'iru ìgwè madu a bara uba; n'ihi na ọ bughi unu nwe agha nka, kama ọ bu Chineke nwe. 16 Echi ridanu imegide ha: le, ha nārigo n'uzọ-nrigo Ziz; unu gāchọta kwa ha na nsọtu ndagwurugwu, n'iru ọzara Jeruel. 17 Ọ bughi unu gēnwe ibu agha n'agha nka: guzonu onwe-unu, guzo, hu nzọputa Jehova n'etiti unu, Juda na Jerusalem: unu atula egwu, unu atu-kwa-la ujọ: echi pukurunu ha; Jehova nọye-kwa-ra unu. 18 Jehoshafat we rube isi kpuchie iru-ya n'ala: Juda nile na ndi bi na Jerusalem da-kwa-ra n'ala n'iru Jehova, ikpọ isi ala nye Jehova. 19 Ndi Livai, bú ndi sitere n'umu ndi Kohat na ndi sitere n'umu ndi Kora, we bilie ito Jehova, bú Chineke Israel, n'olu di uku ri nne. 20 Ha we bilie n'isi-ututu, pua ba n'ọzara Tekoa: ma mb͕e ha nāpu, Jehoshafat guzoro, si, Nurunum, Juda, na ndi bi na Jerusalem; kwerenu na Jehova, bú Chineke-unu, unu gēkwesi kwa ntukwasi-obi; kwerenu na ndi-amuma-Ya, ihe gāga-kwa-ra unu nke-ọma. 21 O we me ka ndi-ya dua ya ọdu, o we guzo ndi nābùku Jehova abù, ndi nēto kwa ima-nma nke idi-nsọ, mb͕e ha nāpu n'obodo n'iru ndi ejikere agha, si, Kelenu Jehova; n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. 22 Ma na mb͕e ha malitere iti nkpu na ito otuto, Jehova tiyere ndi nēru nbì imegide umu Amon na Moab na ugwu Sia, bu ndi nābakuru Juda; ewe tib͕ue ha. 23 Umu Amon na Moab we guzo imegide ndi bi n'ugwu Sia, iwezuga ha ka ebibie ha na ikpochapu ha: mb͕e ha mere ka ndi bi na Sia gwusia, ha we yere onwe-ha aka, nwoke na ibe-ya, ibibi onwe-ha. 24 Juda we biarue ulo-nche, rue ọzara, ha we le ìgwè madu ahu anya; ma, le, ha bu ozu ozu daworo n'ala, ọ dighi kwa onye b͕apuru ab͕apu. 25 Jehoshafat na ndi-ya we bia iluta ihe-nkwata-ha n'agha, ha we hu n'etiti ha ma àkù ma ozu ma ihe di oké ọnu-ahia n'uba, ha we napusia onwe-ha ihe, kari nke ha nwere ike ibū: ha we nọ ubọchi atọ nāluta ihe-nkwata n'agha, n'ihi na ihe bara uba ka ọ bu. 26 Ma n'ubọchi nke-anọ ha kpọkọtara onwe-ha na ndagwurugwu Beraka; n'ihi na n'ebe ahu ka ha gọziri Jehova: n'ihi nka ka ha kpọrọ aha ebe ahu, Ndagwurugwu Bekara, rue ta. 27 Ha we lata, nwoke ọ bula nke Juda na Jerusalem, Jehoshafat nāga kwa n'iru ha, iwere ọṅù lata na Jerusalem; n'ihi na Jehova mere ka ha ṅuria ọṅu n'iru ndi-iro-ha. 28 Ha we chiri une, na ubọ-akwara, na opì, biarue Jerusalem rue ulo Jehova. 29 Oké egwu Chineke we dikwasi ala-eze nile nke ala nile ọzọ, mb͕e ha nuru na Jehova busoro ndi-iro Israel agha. 30 Ala-eze Jehoshafat we di jū: n'ihi na Chineke-ya mere ka o zuru ike buruburu. 31 Jehoshafat we buru eze Juda: ọ b͕ara orú arọ na iri na ise mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze orú arọ na ise nime Jerusalem: aha nne-ya bu Azuba nwa-nwayi Shilhi. 32 O jere ije n'uzọ Esa nna-ya, o sighi kwa nime ya wezuga onwe-ya, nēme ihe ziri ezi n'anya Jehova. 33 Nání na ewezugaghi ebe di elu; ma rue ub͕u a ndi Juda edozighi obi-ha nye Chineke nke ndi bu nna-ha. 34 Ma ihe nile Jehoshafat mere nke fọduru, nke-mbu na nke-ikpe-azu, le, edewo ha n'akwukwọ ihe emere nke Jihu nwa Hanani, onye etiyere aha-ya n'akwukwọ ndi-eze Israel. 35 Ma mb͕e ihe ndia gasiri, Jehoshafat, bú eze Juda, jikọrọ onwe-ya na Ehazaia, bú eze Israel; onye ahu nēmebi iwu n'omume-ya: 36 o we jikọ onwe-ya na ya ime ub͕ọ ijeru Tashish: ha we me ub͕ọ ahu n'Ezion-geba. 37 Elieza nwa Dodavahu nke Marisha we bu amuma megide Jehoshafat, si, N'ihi na i jikọrọ onwe-gi na Ehazaia, Jehova etipúwo ihe i mere. Ewe tiwa ub͕ọ ahu nile, ha enweghi kwa ike ijeru Tashish.

2 Ihe Emere 21

1 Jehoshafat we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Devid: Jehoram nwa-ya we buru eze n'ọnọdu-ya. 2 O nwe-kwa-ra umu-nne-ndikom, bú umu Jehoshafat, aha-ha bu Azaraia, na Jehiel, na Zekaraia, na Azaraia, na Maikael, na Shefataia: ndia nile bu umu-ndikom Jehoshafat, bú eze Israel. 3 Nna-ha we nye ha ọtutu onyinye, nke ọla-ọcha, na nke ọla-edo, na nke ihe di oké ọnu-ahia, ha na obodo ewusiri ike nime Juda: ma ala-eze ka o nyere Jehoram, n'ihi na onye ahu bu ọkpara. 4 Jehoram we bilie ibu onye-isi ala-eze nna-ya, o we me onwe-ya ka ọ di ike, were mma-agha b͕ue umu-nne-ya ndikom nile, ọzọ kwa, o b͕uru ufọdu nime ndi-isi Israel. 5 Orú arọ na iri na abua ka Jehoram b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ asatọ na Jerusalem. 6 O je ije n'uzọ ndi-eze Israel, dika ulo Ehab mere: n'ihi na ọ bu nwa-nwayi Ehab ka ọ nwere na nwunye: o we me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova. 7 Ma Jehova ekweghi ibibi ulo Devid, n'ihi ọb͕ub͕a-ndu ahu Ya na Devid mere, dika Ọ si-kwa-ra na Ọ gēnye ya oriọna, nye kwa umu-ya, ubọchi nile. 8 N'ubọchi-ya ka Edom siri n'okpuru aka Juda jehie, mere onwe-ha eze. 9 Jehoram we gabiga, ya na ndi-isi-ya, ub͕ọ-ala-ya nile so-kwa-ra ya: o rue na o biliri n'abali, tib͕ue Edom ndi nāb͕a ya buruburu, ha na ndi-isi ub͕ọ-ala. 10 Edom we si n'okpuru aka Juda jehie, rue ta: mb͕e ahu ka Libna siri n'okpuru aka-ya jehie n'otù mb͕e ahu: n'ihi na ọ rapuru Jehova, bú Chineke nke nna-ya-hà. 11 Onye ahu me-kwa-ra ebe di elu n'ugwu nile nke Juda, we me ndi bi na Jerusalem ka ha kwa iko, ọ rafu-kwa-ra Juda. 12 Odide-akwukwọ we si n'aka Elaija, bú onye-amuma, biakute ya, si, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Devid nna-gi, siri, N'ihi na i jeghi ije n'uzọ nile nke Jehoshafat nna-gi, ma-ọbu n'uzọ nile nke Esa, bú eze Juda; 13 kama i jewo ije n'uzọ ndi-eze Israel, me Juda na ndi bi na Jerusalem ka ha kwa iko, dika ulo Ehab mere ka akwa iko; ọzọ kwa, umu-nne-gi ndikom, bú ulo nna-gi, ndi di nma kari gi onwe-gi, ka i b͕uworo: 14 le, Jehova nēti ihe-otiti uku n'etiti ndi-gi na n'etiti umu-gi, na n'etiti ndinyom-i, na n'etiti àkù-gi nile: 15 gi onwe-gi kwa, O gēji ọtutu ọria, n'ọria ngiri-afọ-gi, tie gi, rue mb͕e ngiri-afọ-gi gāputa site n'ọria ahu kwa-ubọchi. 16 Jehova we kpọte mọ nke ndi Filistia, na nke Arebia, ndi nọ n'akuku ndi Etiopia, imegide Jehoram: 17 ha we rigo imegide Juda, we tipúe ya, dọta àkù nile ahuru n'ulo eze, na umu-ya ndikom kwa, na ndinyom-ya, n'agha; ọ dighi kwa nwa-nwoke fọduru ya, ọ bu nání Jehoahaz, bú nke-ntà nime umu-ya ndikom. 18 Ma mb͕e ihe nile a gasiri Jehova were ọria nke nādighi ngwọta tie ya na ngiri-afọ-ya. 19 O rue, mb͕e ọtutu ubọchi gasiri, ọbuná na mb͕e ọgwugwu arọ abua gasiri, na ngiri-afọ-ya putara n'ọria-ya, o we nwua n'ajọ ọria. Ma ndi-ya esureghi nsure-ọku nye ya dika nsure-ọku nke nna-ya-hà. 20 Orú arọ na iri na abua ka ọ b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze, o we buru eze na Jerusalem arọ asatọ: o we la buru onye anāchọsighi ike ka ọ di ndu; ha we lìe ya n'obodo Devid, ma ọ bughi n'ílì ndi-eze.

2 Ihe Emere 22

1 Ndi bi na Jerusalem we me Ehazaia nwa-ya nke-ntà eze n'ọnọdu ya: n'ihi na usu ndi nāpunara madu ihe, bú ndi soro ndi Arebia ba n'ọmuma-ulo-ikwū, b͕uru ndi nile bu ya okenye. Ehazaia nwa Jehoram, bú eze Juda, we buru eze. 2 Ọgu arọ abua na abua ka Ehazaia b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze otù arọ na Jerusalem: ma aha nne-ya bu Atalaia nwa Ọmri. 3 Ya onwe-ya je-kwa-ra ije n'uzọ nile nke ulo Ehab: n'ihi na nne-ya bu onye nādu ya ọdu imebi iwu. 4 O we me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika ulo Ehab mere: n'ihi na ndi ahu buru ya ndi nādu ọdu mb͕e ọnwu nna-ya gasiri, iwetara ya nbibi. 5 O jeghari-kwa-ra n'idu-ọdu-ha, we soro Jehoram nwa Ehab, bú eze Israel, ibuso Hazael, bú eze Siria, agha na Remot-gilead: ndi Siria we tib͕ue Joram. 6 O we lata ka agwọ ya nime Jezreel n'ihi ntib͕u nke ha tib͕uru ya na Rema, mb͕e o nēbuso Hazael, bú eze Siria, agha. Azaraia nwa Jehoram, bú eze Juda, we rida ihu Jehoram nwa Ehab nime Jezreel, n'ihi na ọ nāria ọria. 7 Ma o sitere na Chineke, bú nzọda Ehazaia, n'ibiakute Joram: n'ihi na mb͕e ọ biara, o we so Jehoram pukuru Jihu nwa Nimshi, onye Jehova tere manu ibipu ulo Ehab. 8 O rue, mb͕e Jihu nēme ulo Ehab ihe ekpere n'ikpe, na ọ huru ndi-isi Juda, na umu-ndikom nke umu-nne Ehazaia, ndi nējere Ehazaia ozi, o we b͕ue ha. 9 O we chọ Ehazaia, ha we jide ya, (ma onye ahu nēzo onwe-ya nime Sameria, ) ha we me ka ọ biakute Jihu, me ka ọ nwua; ha we lìe ya, n'ihi na ha siri, Nwa Jehoshafat ka ọ bu, onye were obi-ya nile chọ Jehova. Ma ulo Ehazaia enweghi onye nwere ike ijide ala-eze. 10 Mb͕e Atalaia, bú nne Ehazaia, huru na nwa-ya nwoke anwuwo, o bilie, me ka nkpuru nile la n'iyì, bú ndi nwe ala-eze ulo Juda. 11 Ma Jehoshabeat, bú nwa-nwayi eze, were Joash nwa-nwoke Ehazaia, zupu ya n'etiti umu-ndikom eze ndi anēme ka ha nwua, o were ya na nwayi nēnye ya ara, tiye ha n'ime-ulo nke ihe-ndina. Jehoshabeat nwa-nwayi eze, bú Jehoram, nwunye Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, (n'ihi na nwayi ahu bu nwa-nne Ehazaia, ) we zopu ya n'iru Atalaia, o we ghara ime ka ọ nwua. 12 O we nọ n'aka-ha n'ulo Chineke nēzo onwe-ya arọ isi: Atalaia we buru eze ala ahu.

2 Ihe Emere 23

1 Ma n'arọ nke-asa Jehoiaba mere onwe-ya ka ọ di ike, o we chita ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise, bú Azaraia nwa Jehoram, na Ishmael nwa Jehohanan, na Azaraia nwa Obed, na Maaseia nwa Adaia, na Elishafat nwa Zikri, me ka ya na ha b͕a ndu. 2 Ha we nāga buruburu nime Juda, chikọputa ndi Livai n'obodo nile nke Juda, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke Israel, ha we biarue Jerusalem. 3 Nkpọkọta ahu nile na eze we b͕a ndu n'ulo Chineke. Ọ si ha, Le, nwa eze gābu eze, dika Jehova kwuworo bayere umu Devid. 4 Nka bu ihe unu gēme: otù uzọ n'uzọ atọ nime unu, bú ndi nābà nime n'ubọchi-izu-ike, bú nke ndi-nchu-àjà na nke ndi Livai, gābu ndi-ọnu-uzọ-ama nke nbata-uzọ nile; 5 otù uzọ n'uzọ atọ gānọ kwa n'ulo eze, otù uzọ n'uzọ atọ kwa n'ọnu-uzọ-ama nke ntọ-ala: ndi Juda nile gānọ kwa n'ogige ulo Jehova nile. 6 Ma ka onye ọ bula ghara ibà n'ulo Jehova, ọ bu nání ndi-nchu-àjà, na ndi n'etiti ndi Livai ndi nēje ozi; ndi ahu gābà, n'ihi na ndi nsọ ka ha bu: ma ndi Juda nile gēdebe ihe-ndebe ulo Jehova. 7 Ndi Livai gānọ kwa eze buruburu, nwoke ọ bula na ihe-agha-ya n'aka-ya; ma onye nābata n'ulo, ka eme ka ọ nwua: unu nọye-kwa-ra eze mb͕e ọ nābà nime, na mb͕e ọ nāpu n'èzí. 8 Ndi Livai na Juda nile we me dika ihe nile si di nke Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, nyere n'iwu: ha we chiri, nwoke ọ bula ndikom-ya, bú ndi nābà nime n'ubọchi-izu-ike, ha na ndi nāpu apu n'ubọchi-izu-ike; n'ihi na Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, emeghi ka òkè di iche iche pua n'ije-ozi-ha. 9 Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, we nye ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise ube, na ọta, na ọta ntà, nke eze, bú Devid, nwereri, nke di n'ulo Chineke. 10 O guzo ndi Juda nile, nwoke ọ bula na ihe-agha-ya n'aka-ya, site n'akuku aka-nri ulo ahu rue akuku aka-ekpe ulo ahu, n'akuku ebe-ichu-àjà na n'akuku ulo, n'akuku eze buruburu. 11 Ha we me ka nwa eze puta, ha we kpube ya okpu-eze, nye ya ihe-àmà, me ya eze: Jehoiada na umu-ya ndikom we te ya manu; ha we si, Ka eze di ndu. 12 Atalaia we nu olu ndi Juda ka ha nāb͕a ọsọ nēto kwa eze, o we biakute ndi ahu n'ulo Jehova: 13 ọ hu, ma, le, eze nēguzo n'akuku ogidi-ya na nbata, ndi-isi na opì-ha di kwa n'akuku eze; ndi nile nke ala ahu ṅuri-kwa-ra ọṅu, fùa opì; ndi-ọbù-abù ji kwa ihe abù kpọ, ndi nēme ka amara ito otuto nọ kwa. Atalaia we dọwa uwe-ya nile, si, Nkekọta imegide eze, nkekọta imegide eze. 14 Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, we me ka ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise puta, bú ndi-nlekọta usu-ndi-agha, si ha, Menu ka ọ pua ba n'etiti ariri; ma onye nābiaso ya n'azu, ka ewere mma-agha me ka ọ nwua: n'ihi na onye-nchu-àjà siri, Unu emela ka ọ nwua n'ulo Jehova. 15 Ha we doro ya onwe-ha n'akuku abua; o we ba na nbata nke ọnu-uzọ-ama inyinya n'ulo eze: ha we me ka ọ nwua n'ebe ahu. 16 Jehoiada we me ọb͕ub͕a-ndu nke di n'etiti ya na ndi Juda nile na eze, na ha gābu ndi Jehova nwere. 17 Ndi Juda nile we ba n'ulo Beal, kwatue ya, tupia ebe-ichu-àjà-ya nile na onyinyo-ya nile, ha b͕u-kwa-ra Matan, bú onye-nchu-àjà Beal, n'iru ebe-ichu-àjà ahu. 18 Jehoiada we tiye nlekọta nile nke ulo Jehova n'aka ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, ndi Devid kère n'òkè ibu ndi-isi ulo Jehova, isure àjà-nsure-ọku nile nke Jehova, dika edeworo ya n'iwu Moses, n'ọṅù, na n'ibù-abù, site n'aka Devid. 19 O we guzo ndi-ọnu-uzọ-ama n'ọnu-uzọ-ama nile nke ulo Jehova, ka onye ruru árú n'uzọ ọ bula we ghara ibà nime. 20 O we chiri ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise, na ndi di ike nke-uku, na ndi nāchi achi n'etiti ndi Juda, na ndi nile nke ala ahu, me ka eze si n'ulo Jehova rida: ha we si n'etiti ọnu-uzọ-ama nke di n'elu ba n'ulo eze, me ka eze nọkwasi n'oche-eze nke ala-eze. 21 Ndi nile nke ala ahu we ṅuria ọṅu, obodo ahu di-kwa-ra jū: ha we were mma-agha me ka Atalaia nwua.

2 Ihe Emere 24

1 Joash b͕ara arọ asa mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze ọgu arọ abua na Jerusalem: aha nne-ya bu Zibia nke Bia-sheba. 2 Joash we me ihe ziri ezi n'anya Jehova ubọchi nile nke Jehoiada, bú onye-nchu-àjà. 3 Jehoiada we lutara ya ndinyom abua; o we mua umu-ndikom na umu-ndinyom. 4 O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na ọ di n'obi Joash ime ka ulo Chineke di ọhu. 5 O we chikọta ndi-nchu-àjà na ndi Livai, si ha, Puanu, jerue obodo nile nke Juda, chikọputa ego n'Israel nile ime ka ulo Chineke-unu di ike kwa-arọ, unu onwe-unu kwa, menu ngwa ime ihe ahu. Ma ndi Livai emeghi ngwa. 6 Eze we kpọ Jehoiada, bú onye-isi, si ya, Gini mere i jughi ndi Livai ka ha si na Juda, si kwa na Jerusalem, webata ùtú nke Moses, bú orù Jehova, na nke nkpọkọta nke Israel, nke diri ulo-ikwū ihe-àmà? 7 N'ihi na Atalaia, bú nwayi ahu nēmebi iwu, umu-ya ndikom tipúru ulo Chineke; ọzọ kwa, ha were ihe nsọ nile nke ulo Jehova nye Bealim. 8 Eze we gwa ha, ha we me otù ib͕e, dọba ya n'ọnu-uzọ-ama ulo Jehova n'èzí. 9 Ha we kpọsa na Juda na nime Jerusalem, ka ewebatara Jehova utu nke Moses, bú orù Chineke, tukwasiri Israel n'ọzara. 10 Ndi-isi nile na ndi Juda nile we ṅuria ọṅu, webata ihe, tubà ya n'ib͕e ahu, rue mb͕e ha nyebìri. 11 O rue, mb͕e ebubatara ib͕e ahu n'ulo-nlekọta eze site n'aka ndi Livai, mb͕e ha hu-kwa-ra na ego ahu riri nne, na ode-akwukwọ eze na onye-nlekọta nke onye-isi-nchu-àjà biara, wupu ihe di n'ib͕e, būru ya, bughachi ya n'ọnọdu-ya. Otú a ka ha mere kwa-ubọchi, ha we chikọta ego n'uba. 12 Eze na Jehoiada we were ya nye ndi nēje ozi òfùfè ulo Jehova; ha we nēgo ndi nāwa nkume na ndi-ọ̀kà n'osisi ime ka ulo Jehova di ọhu, ha were kwa ya nye ndi-ọ̀kà n'ígwè na ọla ime ka ulo Jehova di ike. 13 Ndi nēje ozi ahu we lua ọlu, ewe jezue ozi ahu n'aka-ha, ha we guzo ulo Chineke dika ọtùtù-ya si di, me ka o sie ike. 14 Mb͕e ha lubìri, ha we weta n'iru eze na Jehoiada ego fọduru, ha we were ya mere ulo Jehova ihe, bú ihe ozi, na isure àjà-nsure-ọku, na ngaji, na ihe ọla-edo na ọla-ọcha. Ha we nēsure àjà-nsure-ọku n'ulo Jehova mb͕e nile ubọchi nile nke Jehoiada. 15 Jehoiada we ghọ agadi, ubọchi ndu-ya we ju ya afọ, o we nwua; ọgu arọ isi na iri ka ọ b͕ara mb͕e ọ nwuru. 16 Ha we lìe ya n'obodo Devid n'etiti ndi-eze, n'ihi na o mere ezi ihe n'Israel, na n'ebe Chineke na ulo-Ya di. 17 Ma mb͕e ọnwu Jehoiada gasiri, ndi-isi Juda biara, kpọ isi ala nye eze. Mb͕e ahu eze gere ha nti. 18 Ha we rapu ulo Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, we fè Asherim na arusi òfùfè: iwe we dikwasi Juda na Jerusalem n'ikpe-ọmuma-ha nka. 19 O zite ndi-amuma n'etiti ha, ime ka ha laghachikute Jehova; ha we b͕a àmà megide ha: ma ha aṅaghi nti. 20 Mọ Chineke we were Zekaraia nwa Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, kpuchie Onwe-ya dika uwe; o we guzo n'elu n'ebe ndi Juda nọ, si ha, Otù a ka Chineke siri; N'ihi gini ka unu onwe-unu nāgabiga ihe nile Jehova nyere n'iwu, ihe we ghara igara unu nke-ọma? n'ihi na unu arapuwo Jehova, Ọ rapuwo kwa unu. 21 Ha we kekọta onwe-ha imegide ya, were nkume tub͕ue ya, n'ihi ihe eze nyere n'iwu, n'ogige ulo Jehova. 22 Joash, bú eze, echetaghi kwa ebere nke Jehoiada, bú nna-ya, mere ya, o we b͕ue nwa-ya. Ma mb͕e ọ nwuru, ọ si, Ka Jehova hu ya, ju ase. 23 O rue, n'ọb͕ub͕a arọ, na usu-ndi-agha Siria rigoro imegide ya: ha we biarue Juda na Jerusalem, bilie ndi-isi nile nke ndi Juda site n'etiti ndi ahu, ha we zigara eze Damaskọs ihe-nkwata-ha nile. 24 N'ihi na usu-ndi-agha Siria chiri ndikom ole-na-ole bia; Jehova we nye usu-ndi-agha bara uba nke-uku n'aka-ha, n'ihi na ha rapuru Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha. Ha we me Joash ihe nile ekpere n'ikpe. 25 Ma mb͕e ha siri n'ebe ọ nọ la, (n'ihi na ha rapuru ya n'ọtutu ọria, ) ndi-orù-ya kekọtara onwe-ha imegide ya n'ihi ọbara umu Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, b͕ue ya n'elu ihe-ndina-ya, o we nwua: ha we lìe ya n'obodo Devid, ma ha elìghi ya n'ílì ndi-eze. 26 Ma ndia bu ndi nēkekọta onwe-ha imegide ya; bú Zabad nwa Shimeat nwayi Amon, na Jehozabad nwa Shimrit nwayi Moab. 27 Ma ihe bayere umu-ya ndikom, na iba-uba nke ibu eboro ya, na ntọ-ala ulo Chineke, le, edewo ha n'akukọ akwukwọ ndi-eze. Amazaia nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

2 Ihe Emere 25

1 Amazaia b͕ara orú arọ na ise mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze orú arọ na iteghete nime Jerusalem: aha nne-ya bu Jehoadan nke Jerusalem. 2 O me ihe ziri ezi n'anya Jehova, nání na o weghi obi zuru okè me ya. 3 O rue, mb͕e ala-eze di ike n'ebe ọ nọ, na o b͕uru ndi-orú-ya ndi tib͕uru eze, bú nna-ya. 4 Ma o meghi ka umu-ha nwua, kama o mere dika ihe edeworo n'iwu n'akwukwọ Moses, nke Jehova nyere n'iwu, si, Ndi bu nna agaghi-anwu n'ọnọdu umu-ha, umu agaghi-anwu kwa n'ọnọdu ndi bu nna-ha; kama onye ọ bula gānwu nime nmehie nke aka ya. 5 Amazaia we chikọta Juda, guzo ha dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, nye ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri, nye kwa ndi-isi usu ọgu ndikom ise, bú Juda na Benjamin nile: o we gukọta ha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, o we hu na ha di orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ iri-na-asa na nnù iri, bú ndi arọputara arọputa, ndi nāpukuru usu-ndi-agha, ndi nēji ube na ọta. 6 O we were ọgu talent ọla-ọcha ise go orú nnù ndikom uzọ iri-na-abua na nnù iri, ha bu ndi-dike bu dìnkpà, site n'Israel. 7 Ma onye nke Chineke biakutere ya, si, Eze, ka usu-ndi-agha Israel ghara iso gi bia; n'ihi na Jehova anọyeghi Israel, bú umu nile nke Efraim. 8 Otú ọ di, gi onwe-gi bia, me ihe, di ike ibu agha: Chineke gēme ka i ghara iso ngọngọ n'iru onye-iro-gi; n'ihi na ike di nime Chineke iye aka na ime ka asu ngọngọ. 9 Amazaia we si onye nke Chineke ahu, Ma gini ka ayi gēme bayere ọgu talent ise ahu nke m'nyeworo usu ndi nāpunara madu ihe nke Israel? Onye nke Chineke we si, Jehova nwere ihe inye gi nke bara uba kari. 10 Amazaia we kewapu ha, bú usu ndi nāpunara madu ihe nke siri n'Efraim biakute ya, ka ha laghachi n'ebe-ha: iwe-ha we di ọku nke-uku megide Juda, ha we laghachi n'ebe-ha n'iwe di ọku. 11 Amazaia we me onwe-ya ka ọ di ike, o we duru ndi-ya, je Ndagwurugwu Nnù, tib͕ue umu Sia, orú nnù ndikom na nnù ise. 12 Ma orú nnù ndikom na nnù ise ọzọ ndi di ndu, umu Juda dọtara ha n'agha, me ka ha bia n'elu nkume di elu, ha we si n'elu nkume di elu ahu tuda ha, ewe tupia ha nile. 13 Ma ndikom nke usu ndi nāpunara madu ihe nke Amazaia zilagara, ka ha ghara iso ya je agha, madere n'obodo nile nke Juda, site na Sameria we rue Bet-horon, tib͕ue nnù madu asa na ọgu iri nime ha, luta ihe-nluta bara uba n'agha. 14 O rue, mb͕e Amazaia latara site na ntib͕u ndi Edom, na ọ chibatara chi nke umu Sia, guzoro ha onwe-ya ibu chi, we kpọ isi ala n'iru ha, surere ha ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ. 15 Iwe Jehova we di ọku imegide Amazaia, o we zigara ya onye-amuma, nke siri ya, N'ìhi gini ka i chọworo chi nke ndi ahu, ndi nānaputaghi ndi-ha n'aka-gi? 16 O rue, mb͕e ọ nāgwa ya okwu, na eze siri ya, Ọ̀ bu iburu eze onye nādu ọdu ka ayi meworo gi? ra aka; n'ìhi gini ka agētib͕u gi? Onye-amuma ahu we ra aka, si, Amawom na Chineke ezubewo ibibi gi, n'ihi na i mewo nka, i geghi kwa idu-ọdum nti. 17 Amazaia, bú eze Juda, we nara idu-ọdu, zigara Joash nwa Jehoahaz, nwa Jihu, bú eze Israel, ozi, si, Bia, ka ayi lerita onwe-ayi anya n'iru. 18 Joash, bú eze Israel, we zigara Amazaia, bú eze Juda, ozi, si, Uke nke di na Lebanon zigara osisi cedar nke di na Lebanon ozi, si, Nye nwam nwoke nwa-gi nwayi na nwunye: anu-ọhia nke di na Lebanon we gabiga, zọpia uke ahu. 19 I siwo, Le, i tib͕uwo Edom; obi-gi we bulie gi elu isọpuru onwe-gi: ub͕u a nọdu n'ulo-gi; n'ìhi gini ka i nākpali onwe-gi n'ihe ọjọ, ka i we da, gi onwe-gi, na Juda soro gi? 20 Ma Amazaia anughi; n'ihi na Chineke ka o sitere, ka O we nye ha n'aka ndi-iro-ha, n'ihi na ha chọrọ chi Edom. 21 Joash, bú eze Israel, we rigo; ya onwe-ya na Amazaia, bú eze Juda, we lerita onwe-ha anya n'iru na Bet-shemesh, nke Juda nwere. 22 Ewe tib͕ue Juda n'iru Israel; ha we b͕alaga, nwoke ọ bula n'ulo-ikwū-ya. 23 Joash, bú eze Israel, we Jide Amazaia, bu eze Juda, nwa Joash nwa Jehoahaz, nime Bet-shemesh, me ka ọ biarue Jerusalem, we tipue mb͕idi Jerusalem site n'ọnu-uzọ-ama Efraim rue ọnu-uzọ-ama nke nkuku, nnù cubit. 24 Ọ chiri ọla-edo na ọla-ọcha nile, na ihe nile ahutara n'ulo Chineke n'aka Obed-edom, na àkù nile nke ulo eze, na ndi edoro na mbe, o we laghachi na Sameria. 25 Amazaia nwa Joash, bú eze Juda, we di ndu mb͕e ọnwu Joash nwa Jehoahaz, bú eze Israel, gasiri, arọ iri na ise. 26 Ma ihe nile nke Amazaia mere nke fọduru, nke-mbu na nke-ikpe-azu, le, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ndi-eze Juda na Israel? 27 Ma site na mb͕e Amazaia siri n'iso Jehova wezuga onwe-ya ha kekọtara nkekọta-madu imegide ya nime Jerusalem; o we b͕alaga na Lekish: ha we ziga ichuso ya rue Lekish, me ka ọ nwua n'ebe ahu. 28 Ha we bute ya n'elu inyinya, lìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Juda.

2 Ihe Emere 26

1 Ndi nile nke Juda we were Uzaia, ma onye ahu b͕ara arọ iri na isi, ha we me ya eze n'ọnọdu nna-ya Amazaia. 2 Ya onwe-ya wuru Ilot, nyeghachi ya Juda, mb͕e eze sorosiri nna-ya-hà dina n'ọnwu. 3 Arọ iri na isi ka Uzaia b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze ọgu arọ abua na iri na abua nime Jerusalem: aha nne-ya bu Jekilia nke Jerusalem. 4 O me ihe ziri ezi n'anya Jehova, dika ihe nile si di nke Amazaia nna-ya mere. 5 O we nọ n'ichọ Chineke n'ubọchi Zekaraia, onye nwere nghọta n'ihu Chineke: ma n'ubọchi ọ nāchọ Jehova, Chineke mere ka ihe gara ya nke-ọma. 6 O we pua, buso ndi Filistia agha, tipúsia mb͕idi Gat, na mb͕idi Jabne, na mb͕idi Ashdod, o we wue obodo n'ala Ashdod na n'etiti ndi Filistia. 7 Chineke we yere ya aka imegide ndi Filistia, na imegide ndi Arebia ndi bi na Gua-beal, na Meunim. 8 Ndi Amon we nye Uzaia onyinye-inata-iru-ọma: aha-ya we rue nbata Ijipt; n'ihi na o mere onwe-ya ka ọ di ike ri nne. 9 Uzaia wu-kwa-ra ulo-elu nime Jerusalem n'ọnu-uzọ-ama nkuku, na n'ọnu-uzọ-ama ndagwurugwu, na na nkuku mb͕idi, we me ka ha di ike. 10 O wu-kwa-ra ulo-elu ufọdu n'ọzara, gwue ọtutu olùlù-miri, n'ihi na o nwere ọtutu anu-ulo; ma n'ebe di ala ala, ma n'ebe di lari: o nwe-kwa-ra ndi-ọlu-ubi na ndi-ọlu-ubi-vine n'ugwu na nime Kamel; n'ihi na ọ bu onye huru ọlu ubi n'anya. 11 Uzaia nwe-kwa-ra usu-ndi-agha ndi nēbu agha, ndi nāpukuru usu-ndi-agha n'usu n'usu, dika ọnu-ọgugu nke ngukọta-ha si di n'aka Jeiel, bú ode-akwukwọ, na Maaseia, bú odozi-okwu, n'okpuru aka Hananaia, otù onye nime ndi-isi eze. 12 Ọnu-ọgugu nile nke ndi-isi ulo nke ndi bu nna, bú ndi-dike bu dìnkpà, di nnù isi na ọgu iri. 13 Ma n'okpuru aka-ha ka usu nke usu-ndi-agha di, orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ iri-na-asatọ na nnù asatọ na ọgu iri-na-ise, ndi nēwere ume nke ndi bu dìnkpà bu agha, iyere eze aka imegide onye-iro. 14 Uzaia we doziere ha, bú usu-ndi-agha nile, ọta, na ube, na okpu-agha, na uwe-agha, na ute, ọbuná rue nkume èbè. 15 O me kwa nime Jerusalem ihe-agha echèputara, bú nchèputa nke onye nēchèputa ihe, idi n'elu ulo-elu nile, na n'elu nkuku mb͕idi nile, iji b͕a àkú na nkume uku. Aha-ya we pua rue ebe di anya; n'ihi na eyere ya aka n'uzọ di ebube, rue mb͕e ọ di ike. 16 Ma mb͕e ọ di ike, obi-ya di elu rue nbibi, o we mekpu emekpu megide Jehova, bú Chineke-ya; o we ba n'ulo uku Jehova isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ. 17 Azaraia, bú onye-nchu-àjà, we baso ya, ya na ọgu ndi-nchu-àjà anọ nke Jehova, bú ndi-dìnkpà: 18 ha we guzo imegide Uzaia, bú eze, si ya, Uzaia, ọ bughi gi nwe isurere Jehova ihe-nsure-ọku nēsì utọ, kama ọ bu ndi-nchu-àjà, bú umu Eron, ndi edoworo nsọ isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ: pua n'ebe nsọ a; n'ihi na i mekpuwo emekpu; ọ gaghi-adi-kwa-ra gi ihe nsọpuru site n'aka Jehova, bú Chineke. 19 Uzaia we wee iwe; ma ihe eji esure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ di n'aka-ya isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; ma mb͕e o nēkosa ndi-nchu-àjà ọnuma, ekpenta wara n'egedege-iru-ya, n'iru ndi-nchu-àjà n'ulo Jehova, n'akuku ebe-ichu-àjà nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ. 20 Azaraia, bú onye-isi-nchu-àjà, na ndi-nchu-àjà nile, we le ya anya, ma, le, ya onwe-ya bu onye-ekpenta n'egedege-iru-ya, ha we me ka ọ pua n'ebe ahu n'ima-jijiji; ọzọ kwa, ya onwe-ya mere ngwa ipu apu, n'ihi na Jehova etib͕uwo ya. 21 Uzaia, bú eze, we buru onye-ekpenta rue ubọchi ọnwu-ya, we biri n'ulo ewupuru iche, ebe ọ bu onye-ekpenta; n'ihi na ebipuru ya n'ulo Jehova: Jotam nwa-ya we buru onye-isi ulo eze, nēkpe ndi ala ahu ikpe. 22 Ma ihe nile nke Uzaia mere nke fọduru, nke-mbu na nke-ikpe-azu, Aisaia nwa Emoz, bú onye-amuma, dere ha n'akwukwọ. 23 Uzaia we so nna-ya-hà dina n'ọnwu; ha we lìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'ọhia olìlì nke ndi-eze nwere; n'ihi na ha siri, Onye-ekpenta ka ọ bu: Jotam nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

2 Ihe Emere 27

1 Orú arọ na ise ka Jotam b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ iri na isi nime Jerusalem: aha nne-ya bu Jerusha nwa-nwayi Zedok. 2 O me ihe ziri ezi n'anya Jehova, dika ihe nile si di nke Uzaia nna-ya mere: nání na ọ baghi n'ulo uku Jehova. Ma ndi Juda nọ nēbibi onwe-ha. 3 Onye ahu wuru ọnu-uzọ-ama ulo Jehova nke di n'elu, o wu-kwa-ra ulo n'uba n'elu mb͕idi Ofel. 4 O wu-kwa-ra obodo ufọdu n'ugwu Juda, wu kwa ulo uku na ulo-elu n'oké ọhia. 5 Onye ahu buso-kwa-ra eze umu Amon agha, we ka ha ike. Umu Amon we nye ya n'arọ ahu ọgu talent ọla-ọcha ise, na orú nnù cor ọka wheat na nnù ise, na orú nnù cor ọka barley na nnù ise. Nka ka umu Amon nyeghachiri ya, n'arọ nke-abua kwa, na n'arọ nke-atọ. 6 Jotam we me onwe-ya ka ọ di ike, n'ihi na o doziri uzọ-ya nile n'iru Jehova, bú Chineke-ya. 7 Ma ihe nile nke Jotam mere nke fọduru, na agha-ya nile, na uzọ-ya nile, le, edewo ha n'akwukwọ ndi-eze Israel na Juda. 8 Orú arọ na ise ka ọ b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze, o we buru eze arọ iri na isi nime Jerusalem. 9 Jotam we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, ha we lìe ya n'obodo Devid: Ehaz nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

2 Ihe Emere 28

1 Orú arọ ka Ehaz b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ iri na isi nime Jerusalem: ma o meghi ihe ziri ezi n'anya Jehova, dika Devid nna-ya: 2 kama o jere ije n'uzọ nile nke ndi-eze Israel, ọzọ kwa, o mere arusi awuru awu nye Bealim. 3 Onye ahu sure-kwa-ra ihe-nsure-ọku nēsì isì utọ nime ndagwurugwu nwa Hinom, sure kwa umu-ya n'ọku, dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di, bú ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel. 4 Ọ chua aja, sure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe nile di elu, na n'elu ugwu ntà nile, na n'okpuru osisi ndu ọ bula. 5 Jehova, bú Chineke-ya, we nye ya n'aka eze Siria; ha we tib͕ue ya, si nime ndi-ya dọta ndọta-n'agha uku, me ka ha biarue Damaskọs. Ọzọ kwa, n'aka eze Israel ka enyere ya, o we tib͕ue ya oké ntib͕u. 6 Peka nwa Remalaia b͕uru nime Juda orú nnù ndikom uzọ iri-na-ise n'otù ubọchi, ha nile bu ndi-dìnkpà; n'ihi na ha rapuru Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha. 7 Zikri, bú dike nke Efraim, we b͕ue Maaseia nwa eze, na Azrikam, bú onye-ndú nke ulo, na Elkena nke bu-kwa-ra eze dika onye nke-abua. 8 Umu Israel we dọta n'agha nime umu-nne-ha orú nnù madu orú uzọ na uzọ ise, bú ndinyom, na umu-ndikom, na umu-ndinyom, ọzọ kwa, ọtutu ihe-nkwata ka ha lutara n'aka-ha n'agha, ha we webata ihe-nkwata ahu na Sameria. 9 Ma otù onye-amuma Jehova nọ n'ebe ahu, Oded bu aha-ya: ọ pua izute usu-ndi-agha ahu nke nābiaru Sameria, ọ si ha, Le, ọ bu n'ihi na Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, kosara Juda ọnuma, ka O nyere ha n'aka-unu, unu we were ọnuma nke ruru elu-igwe b͕ue ha. 10 Ma ub͕u a unu onwe-unu nāsi na unu gāzọda umu Juda na Jerusalem ka ha ghọrọ unu ndi-orù na ndinyom nēje ozi: ma unu onwe-unu, ìhe ikpe-ọmuma adighi kwa n'etiti unu n'ebe Jehova, bú Chineke-unu, nọ? 11 Ma ub͕u a nurunum, zighachi ndọta-n'agha ahu, nke unu dọtara n'agha site n'umu-nne-unu: n'ihi na iwe di ọku nke Jehova di n'aru unu. 12 Ndikom ufọdu nime ndi-isi umu Efraim, bú Azaraia nwa Jehohanan, na Berekaia nwa Meshilemot, na Jehizkia na Shalum, na Amasa nwa Hadlai, we bilie imegide ndi nēsi n'usu-ndi-agha bia, 13 ha we si ha, Unu agaghi-ewebata ndọta-n'agha ahu n'ebe a: n'ihi na tukwasi ikpe-ọmuma Jehova nke mara ayi, unu onwe-unu nāsi na unu gātukwasi ihe na nmehie nile ayi na n'ikpe-ọmuma-ayi: n'ihi na o riri nne, bú ikpe-ọmuma mara ayi, iwe di ọku di kwa n'aru Israel. 14 Ndi ejikere agha we rapu ndọta-n'agha ahu na ihe-nluta-n'agha ahu n'iru ndi-isi na nkpọkọta ahu nile. 15 Ndikom ahu ndi akpọrọ n'aha n'aha we bilie, jide ndọta-n'agha ahu, yikwasi ndi-ha b͕ara ọtọ uwe site n'ihe-nkwata ahu, ha we yikwasi ha uwe, yikwasi kwa ha akpukpọ-ukwu, me ha ka ha rie ihe, me kwa ha ka ha ṅua ihe-ọṅuṅu, te ha manu, nēdu ha n'elu inyinya-ibu, bú onye ọ bula nāsu ngọngọ, ha we me ka ha biarue Jeriko, bú obodo ukwu, di umu-nne-ha nso: ha we laghachi na Sameria. 16 Na mb͕e ahu ka eze, bú Ehaz, zigara ndi-eze Asiria ozi ka ha yere ya aka. 17 Ndi Edom bia-kwa-ra ọzọ tib͕ue Juda, we dọta ndọta-n'agha n'agha. 18 Ndi Filistia batakwara n'obodo nile nke ebe di ala ala, na nke Negeb nke diri Juda, ha were kwa Bet-shemesh, na Ajalon, na Gedirot, na Soko na umu-obodo-ya, na Timna na umu-obodo-ya, na Gimzo na umu-obodo-ya: ha we biri n'ebe ahu. 19 N'ihi na Jehova mere ka Juda ruru ala, n'ihi Ehaz, bú eze Israel; n'ihi na o mere ka Juda ghara idi nchikọta, o we mekpu emekpu nke-uku megide Jehova. 20 Tilgat-pilnesa, bú eze Asiria, we biakute ya, kpab͕ue ya, ma o meghi ya ka ọ di ike. 21 N'ihi na Ehaz kère ulo Jehova, na ulo eze na ndi-isi, nye eze Asiria òkè: ma ọ bughi ihe yere ya aka. 22 Ma na mb͕e nkpab͕u ahu akpab͕uru ya, o mekpuru emekpu kari imegide Jehova, bú eze Ehaz nka. 23 O we chuara chi nile nke Damaskọs àjà, bú ndi tib͕uru ya: ọ si, N'ihi na chi nke ndi-eze Siria nēyere ha aka, ndi ahu ka m'gāchuru àjà, ka ha we yerem aka. Ma chi ahu buru ya, bu-kwa-ra Isarel nile, ihe mere ka ọ su ngọngọ. 24 Ehaz we chikọta ihe nile nke ulo Chineke, b͕u ngwongwo ihe nile nke ulo Chineke, mechie ọnu-uzọ nile nke ulo Jehova, mere onwe-ya ebe-ichu-àjà di iche iche nime nkuku nile nime Jerusalem. 25 N'obodo nile ọ bula nke Juda ka o me-kwa-ra ebe di elu isurere chi di iche iche ọzọ ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, o we kpasue Jehova, bú Chineke nke nna-ya-hà, iwe. 26 Ma ihe nile o mere nke fọduru, na uzọ-ya nile, nke-mbu na nke-ikpe-azu, le, edewo ha n'akwukwọ ndi-eze Juda na Israel. 27 Ehaz we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, ha we lìe ya n'obodo ahu, bú nime Jerusalem; ma ha ebubataghi ya n'ílì ndi-eze Israel: Hezekaia nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

2 Ihe Emere 29

1 Hezekaia malitere ibu eze mb͕e ọ b͕ara orú arọ na ise; o we buru eze orú arọ na iteghete nime Jerusalem: aha nne-ya bu Abaija nwa-nwayi Zekaraia. 2 O me ihe ziri ezi n'anya Jehova, dika ihe nile si di nke Devid nna-ya mere. 3 Onye ahu, n'arọ mbu nke ọ bu eze, n'ọnwa mbu, o meghere uzọ ulo Jehova, me ka ha di ike. 4 O we me ka ndi-nchu-àjà na ndi Livai bata, o we chikọbata ha n'amá ọwuwa-anyanwu, 5 si ha, Nurunum, ndi Livai; ub͕u a donu onwe-unu nsọ, do kwa ulo Jehova, bú Chineke nna-unu-hà, nsọ, me ka idi na nsọ-unu pua n'ebe nsọ ahu. 6 N'ihi na nna-ayi-hà mekpuru emekpu, me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, bú Chineke-ayi, ha we rapu Ya, si n'ebe-obibi Jehova chigharia iru-ha, b͕akuta azu-ha. 7 Ọzọ, ha emechiwo ọnu-uzọ nile nke uzọ-nbata, menyu oriọna nile, ha esureghi kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ha esureghi kwa àjà-nsure-ọku, n'ebe nsọ ahu, nye Chineke Israel. 8 Iwe Jehova we dikwasi Juda na Jerusalem, O we rara ha nye ka ha buru ihe-nkwaghari, na ibu ihe-iju-anya, na ibu ihe-ima-ọsọ, dika unu onwe-unu nēwere anya-unu hu. 9 Ma, le, nna-ayi-hà adawo site na mma-agha, umu-ayi ndikom na umu-ayi ndinyom na ndinyom-ayi nọ na ndọta-n'agha n'ihi nka. 10 Ub͕u a ọ di n'obim ka ayi na Jehova, bú Chineke Israel, b͕a ndu, ka iwe-Ya nke di ọku we si n'ebe ayi nọ chigharia. 11 Umum, ub͕u a unu ejehiela: n'ihi na ọ bu unu ka Jehova rọputara iguzo n'iru Ya, ijere Ya ozi, na iburu Ya ndi nēje ozi na ndi nēsure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ. 12 Ndi Livai we bilie, bú Mehat nwa Amasai, na Joel mwa Azaraia, ndi sitere n'umu ndi Kohat: na Kish nwa Abdi, na Azaraia nwa Jehalelel, ndi sitere n'umu Merari: na Joa nwa Zima, na Iden nwa Joa, ndi sitere na ndi Giashon: 13 na Shimri na Jeuel, ndi sitere n'umu Elizafan: na Zekaraia na Matanaia, ndi sitere n'umu Esaf: 14 na Jehuel na Shimai, ndi sitere n'umu Himan: na Shemaia na Uziel, ndi sitere n'umu Jedutum. 15 Ha we chikọta umu-nne-ha ndikom, do onwe-ha nsọ, ba, dika ihe ahu si di nke eze nyere n'iwu, site n'okwu, ime ka ulo Jehova di ọcha. 16 Ndi-nchu-àjà we ba n'ime-ime nke ulo Jehova, ime ka o di ọcha, ha we buputa ihe ruru árú nile nke ha chọtara n'ulo uku Jehova tiye ya n'ogige ulo Jehova. Ndi Livai we nara ya, ibupu ya je miri-iyi Kidron n'èzí. 17 Ha we malite ido nsọ n'ubọchi mbu nke ọnwa mbu, n'ubọchi nke-asatọ nke ọnwa ka ha biaruru uzọ-nbata Jehova; ha we do ulo Jehova nsọ n'ubọchi asatọ: ọ bu kwa n'ubọchi nke-iri-na-isi nke ọnwa mbu ka ha dobìri ya nsọ. 18 Ha we ba nime biakute Hezekaia, bú eze, si, Ayi emewo ka ulo Jehova nile di ọcha, ya na ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku, na ihe-ya nile, na Table achicha anēdo n'usoro, na ihe-ya nile. 19 Ihe nile kwa nke eze, bú Ehaz, juru aju mb͕e ọ bu eze mb͕e o mekpuru emekpu, ndia ka ayi doziworo, do kwa nsọ; ma, le, ha di n'iru ebe-ichu-àjà Jehova. 20 Hezekaia, bú eze, we bilie n'isi-ututu, chikọta ndi-isi obodo, rigorue ulo Jehova. 21 Ha we webata oke-ehi asa, na ebulu asa, na umu-aturu asa, na nkpi asa, ibu àjà-nmehie n'ihi ala-eze, na n'ihi ebe nsọ ahu, na n'ihi Juda. Ọ si umu Eron, bú ndi-nchu-àjà, ka ha sure ha ọku n'elu abe-ichu-àjà Jehova. 22 Ha we b͕ue oke-ehi asa ahu, ndi-nchu-àjà we nara ọbara-ha, wusa n'ebe-ichu-àjà: ha b͕u-kwa-ra ebulu asa ahu, wusa ọbara-ha n'ebe-ichu-àjà: ha b͕u-kwa-ra umu-aturu ahu, wusa ọbara-ha n'ebe-ichu-àjà. 23 Ha we weta nkpi asa nke àjà-nmehie nso n'iru eze na nkpọkọta Juda; ha we bikwasi ha aka-ha: 24 ndi-nchu-àjà we b͕ue ha, were ọbara-ha chua àjà-nmehie n'ebe-ichu-àjà, ikpuchiri Israel nile nmehie: n'ihi na eze siri, Ọ diri Israel nile, bú àjà-nsure-ọku a na àjà-nmehie a. 25 O we guzo ndi Livai n'ulo Jehova, ndi chiri ájà, na une, na ubọ-akwara, dika ihe ahu si di nke Devid, na Gad, bú onye-ọhu-uzọ nke eze, na Netan, bú onye-amuma, nyere n'iwu: n'ihi na o sitere n'aka Jehova, bú ihe ahu enyere n'iwu, site n'aka ndi-amuma-Ya. 26 Ndi Livai we chiri ihe Devid guzo, ndi-nchu-àjà chiri kwa opì. 27 Hezekaia we si ka esure àjà-nsure-ọku n'ebe-ichu-àjà. Ma na mb͕e amalitere isure àjà-nsure-ọku, amalitere ibù abù Jehova, na ifù opì nile, na ikpọ ihe nile bu ubọ nke Devid, bú eze Israel. 28 Nkpọkọta ahu nile nākpọ kwa isi ala, ndi-ọbù-abù nābù kwa, ndi nāfù opì nāfù kwa: anēme ihe a nile rue mb͕e achubìri àjà-nsure-ọku. 29 Ma mb͕e ha surebìsiri àjà-nsure-ọku, eze na ndi nile ahuru n'ebe ọ nọ ruru ala, we kpọ isi ala. 30 Hezekaia, bú eze, na ndi-isi we si ndi Livai ka ha were okwu nke Devid, na nke Esaf, bú onye-ọhu-uzọ, to Jehova. Ha we to Chineke rue ọṅù, ha we rube isi kpọ isi ala. 31 Hezekaia we za, si, Ub͕u a unu emejuwo aka-unu n'ebe Jehova nọ, bianu nso webata àjà na àjà-ekele n'ulo Jehova. Nkpọkọta Juda we webata àjà na àjà-ekele; onye ọ bula nke nwere afọ-ofufo weta-kwa-ra àjà-nsure-ọku. 32 Ọnu-ọgugu àjà-nsure-ọku, nke nkpọkọta Juda wetara, we di ọgu oke-ehi atọ na iri, na ọgu ebulu ise, na ọgu umu-aturu iri: ndia nile bu ihe àjà-nsure-ọku ichuru Jehova. 33 Ihe edoro nsọ di kwa nnù oke-ehi na ọgu iri, na nnù aturu asa na ọgu iri. 34 Nání na ndi-nchu-àjà di ole-na-ole, ha apughi kwa ib͕a akpukpọ anu àjà-nsure-ọku nile: umu-nne-ha, bú ndi Livai, we me ka ha di ike, rue mb͕e ejebìri ozi ahu, ru kwa mb͕e ndi-nchu-àjà doro onwe-ha nsọ: n'ihi na ndi Livai nwere obi ziri ezi kari ndi-nchu-àjà ido onwe-ha nsọ. 35 Ọzọ kwa, àjà-nsure-ọku bara uba, tiyere abuba nke àjà-udo nile, tiye-kwa-ra àjà-ihe-ọṅuṅu nile nke diri àjà-nsure-ọku. Ewe dozie òfùfè ulo Jehova. 36 Hezekaia we ṅuria, ya na ndi-ya nile, n'ihi ihe nke Chineke doziri nye ndi ahu: n'ihi na ọ bu na mberede ka ihe a mere.

2 Ihe Emere 30

1 Hezekaia we zigara Israel na Juda nile ozi, ọzọ kwa, o degara Efraim na Manase akwukwọ-ozi, ka ha biarue ulo Jehova nime Jerusalem, imere Jehova, bú Chineke Israel, ememe ngabiga. 2 Eze we nara idu-ọdu, ya na ndi-isi-ya, na nkpọkọta Juda nile nime Jerusalem, ime ememe ngabiga n'ọnwa nke-abua. 3 N'ihi na ha apughi ime ya na mb͕e ahu, n'ihi na ndi-nchu-àjà adoghi onwe-ha nsọ n'ọnu-ọgugu nke gēzuru ihe ahu, ndi Israel achikọtaghi kwa onwe-ha biarue Jerusalem. 4 Ihe a ziri ezi n'anya eze ma n'anya nkpọkọta Israel nile. 5 Ha we guzo okwu a, ikwusa n'Israel nile, site na Bia-sheba we rue Dan, ka ha bia imere Jehova, bú Chineke Israel, ememe ngabiga nime Jerusalem: n'ihi na ha emeghi ya dika edeworo ya n'akwukwọ n'ọtutu mb͕e gara aga. 6 Ndi-ọb͕a-ọsọ we were akwukwọ-ozi sitere n'aka eze na ndi-isi-ya jeghari n'Israel na Juda nile, na dika ihe eze nyere n'iwu si di, si, Umu Israel, laghachikutenu Jehova, bú Chineke Abraham na Aisak na Israel, ka O we laghachikuru ndi b͕apuru ab͕apu ndi fọduru unu site n'aka ndi-eze Asiria. 7 Unu adi-kwa-la ka nna-unu-hà, na dika umu-nne-unu, ndi mekpuru emekpu megide Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, O we rara ha nye ibu ihe-iju-anya, dika unu onwe-unu nāhu. 8 Ub͕u a unu ekwesila olu-unu ike, dika nna-unu-hà mere; ma nyenu Jehova aka-unu, ba n'ebe nsọ Ya, nke O doworo nsọ rue mb͕e ebighi-ebi, fè-kwa-nu Jehova, bú Chineke-unu, òfùfè, ka iwe-Ya nke di ọku we si n'ebe unu nọ chigharia. 9 N'ihi na asi na unu alaghachikute Jehova, agēnwe obi-ebere n'aru umu-nne-unu na umu-unu n'iru ndi adọtara ha n'agha, ha gābiaghachi kwa n'ala nka: n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, nēme amara, nwe kwa obi-ebere, Ọ gaghi-esi kwa n'ebe unu nọ wezuga iru-Ya, ọ buru na unu alaghachikute Ya. 10 Ndi-ọb͕a-ọsọ ahu we nāgabiga site n'obodo rue obodo n'ala Efraim na Manase, we rue Zebulun: ha we nāchì ha ọchì, lelì kwa ha anya. 11 Otú ọ di, ndikom ufọdu ndi sitere n'Asha na Manase, site kwa na Zebulun, ruru ala, we bia Jerusalem. 12 Aka Chineke di kwa na Juda inye ha otù obi, ime ihe eze na ndi-isi nyere n'iwu site n'okwu Jehova. 13 Ewe chikọta ndi bara uba nime Jerusalem ime ememe achicha ekoghi-eko n'ọnwa nke-abua, bú nkpọkọta bara uba nke-uku. 14 Ha we bilie wezuga ebe-ichu-àjà nile nke di na Jerusalem, ha wezuga-kwa-ra ebe nile nke isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ha we kpofue ha nime miri-iyi Kidron. 15 Ha we b͕ue anu ngabiga n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa nke-abua: ma ihere mere ndi-nchu-àjà na ndi Livai, ha we do onwe-ha nsọ, webata àjà-nsure-ọku n'ulo Jehova. 16 Ha we guzo n'ebe-nguzo-ha, dika ikpé-ha si di, dika iwu Moses, bú onye nke Chineke, si di: ndi-nchu-àjà nāwusa ọbara nke ha natara n'aka ndi Livai. 17 N'ihi na ha bara uba nime nkpọkọta ahu, bú ndi nēdoghi onwe-ha nsọ: ndi Livai we buru ndi-isi n'ib͕uru onye ọ bula nādighi ọcha anu ngabiga, ido ha nsọ nye Jehova. 18 N'ihi na ọtutu ndi Israel, bú ọtutu ndi sitere n'Efraim na Manase na Isaka na Zebulun, emeghi onwe-ha ka ha di ọcha, kama ha riri oriri ngabiga otú anēdeghi ya n'akwụkwọ. Ma Hezekaia kpere ekpere bayere ha, si, Ka Jehova, bú ezi Onye ahu, kpuchiere onye ọ bula nmehie-ya, 19 bú onye doziworo obi-ya ichọ Chineke, bú Jehova, Chineke nke nna-ya-hà, ọ bu ezie na emeghi ka ọ di ọcha dika ime-ka-adi-ọcha nke ebe nsọ ayi si di. 20 Jehova we ge Hezekaia nti, me ka ndi Israel diri ndu. 21 Umu Israel ndi ahuru nime Jerusalem we me ememe achicha ekoghi-eko ubọchi asa n'ọṅù uku: ndi Livai na ndi-nchu-àjà nēto kwa Jehova kwa-ubọchi, chiri ihe nādasi udà ike nēto Jehova. 22 Hezekaia we gwa ndi Livai nile okwu nābà ha n'obi, bú ndi nwere ezi uche bayere Jehova. Ha we rie ihe ahu akara àkà ubọchi asa ahu, nāchu àjà, bú àjà-udo, nēkele kwa Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha. 23 Nkpọkọta ahu nile we nara idu-ọdu ime ememe ubọchi asa ọzọ: ha we were ọṅù me ememe ubọchi asa ọzọ. 24 N'ihi na Hezekaia, bú eze Juda, buliri nye nkpọkọta ahu nnù oke-ehi abua na ọgu iri, na nnù aturu iri-na-asa na ọgu iri; ndi-isi buli-kwa-ra nye nkpọkọta ahu nnù oke ēhi abua na ọgu iri, na orú nnù aturu na nnù ise: ndi-nchu-àjà we do onwe-ha nsọ n'uba. 25 Ha we ṅuria, bú nkpọkọta nile nke Juda, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na nkpọkọta nile ndi nēsi n'Israel bia, na ndi-ọbìa ndi nēsi n'ala Israel bia, ndi nēbi kwa na Juda. 26 Ọṅù uku we di na Jerusalem: n'ihi na site n'ubọchi Solomon nwa Devid, bú eze Israel, ihe dika nka adighi nime Jerusalem. 27 Ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, we bilie gọzie ndi ahu: ewe nu olu-ha, ekpere-ha we biarue ebe-obibi-Ya di nsọ, rue elu-igwe.

2 Ihe Emere 31

1 Ma mb͕e emere ka ihe a nile gwusia, Israel nile ndi ahuru n'ebe ahu puru jerue obodo nile nke Juda, titue ogidi nile, b͕utu kwa Asherim, kwatu kwa ebe di elu nile na ebe-ichu-àjà nile, me ka ha pua na Juda na Benjamin nile, n'Efraim kwa na Manase, rue mb͕e emere ka ha gwusia. Umu Israel nile we laghachi, nwoke ọ bula n'ihe-onwunwe-ya, rue obodo-ha. 2 Hezekaia we guzo òkè nile nke ndi-nchu-àjà na ndi Livai, dika òkè nile ha si di, nwoke ọ bula dika òfùfè-ya si di, ma ndi-nchu-àjà ma ndi Livai, ichu àjà-nsure-ọku na àjà-udo, ije ozi, na ikele ekele, na ito Chineke n'ọnu-uzọ-ama nile nke ọmuma-ulo-ikwū Jehova. 3 O guzo-kwa-ra òkè eze sitere n'àkù-ya iji chu àjà-nsure-ọku, bú àjà-nsure-ọku nke ututu na nke anyasi, na àjà-nsure-ọku anāchu n'ubọchi-izu-ike nile, na nke anāchu n'ọnwa ọhu nile, na nke anāchu na mb͕e nile akara àkà, dika edeworo ya n'iwu Jehova. 4 O we si ndi Juda, bú ndi bi na Jerusalem, ka ha nye òkè ndi-nchu-àjà na ndi Livai, ka ha we di ike n'iwu Jehova. 5 Ma mb͕e ekwusara okwu ahu, umu Israel nyere nkpuru mbu nke ọka, na nke manya-vine ọhu, na nke manu, na nke manu-aṅu, na nke ihe-ọmume nile nke ubi, n'uba; otù uzọ n'uzọ iri nke ihe nile ka ha bubatara n'uba. 6 Umu Israel na Juda, ndi bi n'obodo Juda nile, ndi ahu bubata-kwa-ra otù uzọ n'uzọ iri nke ìgwè ehi na ìgwè ewu na aturu, na otù uzọ n'uzọ iri nke ihe nsọ nke edoro nsọ nye Jehova, bú Chineke-ha, ha we tinye aha n'obo n'obo. 7 N'ọnwa nke-atọ ka ha malitere itọ ntọ-ala nke obo ahu, n'ọnwa nke-asa ka ha tubìri ha. 8 Hezekaia na ndi-isi we bia hu obo nile, gọzie Jehova, na ndi-Ya, bú Israel. 9 Hezekaia we jua ndi-nchu-àjà na ndi Livai ajuju bayere obo ahu. 10 Azaraia, bú onye-isi-nchu-àjà, nke ulo Zedok, we gwa ya, si, Site na mb͕e ha malitere ibubata àjà-nbuli n'ulo Jehova, ayi erijuwo afọ, rifọ kwa ihe n'uba: n'ihi na Jehova agọziwo ndi-Ya; ma nke fọduru bu ọtutu ihe nile a. 11 Hezekaia we si ka edozie ime-ulo n'ulo Jehova; ha we dozie. 12 Ha we bubata àjà-nbuli, na otù uzọ n'uzọ iri, na ihe nsọ nile, n'ikwesi-ntukwasi-obi: ma otù onye-ndú nāchi ha bu Konanaia onye Livai, Shimai nwa-nne-ya bu kwa nke-abua. 13 Na Jehiel, na Azazaia, na Nehat, na Asahel, na Jerimot, na Jozabad, na Eliel, na Ismakia, na Mehat, na Benaia, bú ndi-nlekọta n'okpuru aka Konanaia na Shimai nwa-nne-ya, site n'otú Hezekaia, bú eze, na Azaraia, bú onye-ndú ulo Chineke, mere ha ndi-nlekọta. 14 Kore nwa Imna, bú onye Livai, onye-ọnu-uzọ-ama n'akuku ọwuwa-anyanwu, bu onye-isi onyinye-afọ-ofufo Chineke, inye àjà-nbuli Jehova na ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile. 15 Iden, na Miniamin, na Jeshua, na Shemaia, na Amaraia, na Shekanaia, nọ kwa n'aka-ya, n'obodo ndi-nchu-àjà, n'ọnọdu-ha, bú nke ndi kwesiri ntukwasi-obi, inye umu-nne-ha ihe n'òkè, bú inye onye ntà otú anēnye onye uku: 16 nāgughi ndi di n'akwukwọ-osuso-ọmumu-ha nke ndikom, site na ndi b͕ara arọ atọ we ga n'iru, bú onye ọ bula nke nābà n'ulo Jehova, ilu ọlu ubọchi n'ubọchi-ya, ifè òfùfè-ha n'ihe-ndebe nile ha dika òkè nile ha si di; 17 na ndi di n'akwukwọ-osuso-ọmumu nke ndi-nchu-àjà dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, na ndi Livai site na ndi b͕ara orú arọ we ga n'iru, n'ihe-ndebe nile ha n'òkè nile ha; 18 na ndi di n'akwukwọ-osuso-ọmumu n'etiti umu-ntakiri-ha nile, na ndinyom-ha, na umu-ha ndikom, na umu-ha ndinyom, nime nkpọkọta Israel nile: n'ihi na n'ọnọdu-ha, bú nke ndi kwesiri ntukwasi-obi, ka ha doro onwe-ha nsọ n'idi-nsọ: 19 umu Eron kwa, bú ndi-nchu-àjà, ndi nọ n'ọhia nke ebe-ita-nri obodo-ha, n'obodo nile ọ bula, ha nwere ndikom ndi akpọrọ n'aha n'aha, inye ndikom nile n'etiti ndi-nchu-àjà òkè-ha, inye kwa ndi nile ndi di n'akwụkwọ-osuso-ọmumu n'etiti ndi Livai. 20 Hezekaia we me otú a nime Juda nile; o we me ezi ihe na nke ziri ezi na ezi-okwu n'iru Jehova, bú Chineke-ya. 21 Ma n'ọlu ọ bula nke ọ malitere n'òfùfè nke ulo Chineke, na n'iwu, na n'ihe nile enyere n'iwu, ichọ Chineke, ọ bu obi-ya nile ka o ji me ya, ihe we gara ya nke-ọma.

2 Ihe Emere 32

1 Mb͕e ihe ndia na ezi-okwu a gasiri, Senakerib, bú eze Asiria, biara, ba nime Juda, we ma ulo-ikwū-ya imegide obodo nile ewusiri ike, si na o gētipú ha nye onwe-ya. 2 Hezekaia we hu na Senakerib abiawo, che iru ibuso Jerusalem agha, 3 o we me ndi-isi-ya na ndi-dike-ya ka ha dua ya ọdu, ib͕ochi miri nke isi-iyi nile nke di n'azu obodo; ha we yere ya aka. 4 Ewe chikọta ndi di ọtutu, ha we b͕ochie isi-iyi nile, na miri-iyi ahu nke nērùsi ike n'etiti ala-ha, si, N'ìhi gini ka ndi-eze Asiria gābia, hu ọtutu miri? 5 O we me onwe-ya ka ọ di ike, we wuzie mb͕idi nile nke etipúru etipú, o we wulie ya rue ulo-elu-ya nile, wu kwa mb͕idi ọzọ n'azu, me ka Milo, nke di n'obodo Devid, di ike, o me-kwa-ra ihe-agha na ọta n'uba. 6 O we do ndi-ọchi-agha ka ha buru ndi-isi ndi-ya, o we chikọta ha n'ebe ọ nọ n'amá nke ọnu-uzọ-ama obodo, gwa ha okwu nābà n'obi-ha, si, 7 Dinu ike nwe kwa ume, unu atula egwu atu-kwa-la ujọ n'ihi eze Asiria, ma-ọbu n'ihi ìgwè ahu nile nke nọyere ya: n'ihi na nke nọyere ayi di ọtutu kari nke nọyere ya: 8 nke nọyere ya bu ogwe-aka nke anu-aru; ma Nke nọyere ayi bu Jehova, Chineke-ayi, iyere ayi aka na ibu agha nile ayi. Ndi Juda we dabere onwe-ha n'elu okwu nile nke Hezekaia, bú eze Juda. 9 Mb͕e nka gasiri, Senakerib, bú eze Asiria, zigara ndi-orù-ya na Jerusalem, (ma ya onwe-ya nānọchigide Lekish n'agha, ya na ndi nile ọ nāchi, ) jekuru Hezekaia, bú eze Juda, jekuru kwa Juda nile ndi nọ na Jerusalem, si, 10 Otú a ka Senakerib, bú eze Asiria, siri, N'ìhe gini ka unu onwe-unu nātukwasi obi, unu we nānọdu n'ebe ewusiri ike, bú nime Jerusalem? 11 Hezekaia, ọ̀ dighi-akpali unu, ira unu nye ka unu nwua site n'oké unwu, site kwa n'akpiri-ikpọ-nku, si, Jehova, bú Chineke-ayi, gānaputa ayi n'ọbu-aka eze Asiria? 12 Ọ̀ bughi Hezekaia ahu wezugara ebe-Ya nile di elu na ebe-ichu-àjà-Ya nile, gwa Juda, gwa kwa Jerusalem, si, Ọ bu n'iru otù ebe-ichu-àjà ka unu gākpọ isi ala, ọ bu kwa n'elu ya ka unu gēsure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ? 13 Ùnu amaghi ihe m'mere ndi nile nke ala ọzọ nile, mu onwem na nnam-hà? chi mba nile nke ala ọzọ nile, hà puru inaputa ala-ha n'akam ma-ọli? 14 Ọ̀ bu onye n'etiti chi nile nke mba ndia, bú ndi nnam-hà wezugara ka ebibie ha, nke puru inaputa ndi-ya n'akam, na Chineke-unu puru inaputa unu n'akam? 15 Ma ub͕u a unu ekwela Hezekaia rafue unu, kpali kwa unu otú a, unu ekwe-kwa-la ya: n'ihi na ọ dighi chi ọ bula nke mba ọ bula ma-ọbu ala-eze ọ bula puru inaputa ndi-ya n'akam, ma-ọbu n'aka nnam-hà: n'ezie Chineke-unu agaghi-anaputa kwa unu n'akam. 16 Ndi-orù-ya kwu-kwa-ra okwu ọzọ imegide Jehova, bú Chineke, na imegide orù-Ya, bú Hezekaia. 17 Ọ de-kwa-ra akwukwọ, ita Jehova, bú Chineke Israel, uta, na ikwu okwu megide Ya, si, Dika chi mba nile nke ala ọzọ nile, ndi nānaputaghi ndi-ha n'akam, otú a Chineke Hezekaia agaghi-anaputa ndi-ya n'akam. 18 Ha we were oké olu kpọ ndi Jerusalem ndi nọ n'elu mb͕idi òkù n'asusu ndi-Ju, ime ka ha tua egwu, na ime ka ha ma jijiji; ka ha we were obodo-ha. 19 Ha we kwue okwu bayere Chineke Jerusalem, dika ha si ekwu okwu bayere chi nile nke ndi uwa, bú ọlu aka madu. 20 Hezekaia, bú eze, na Aisaia nwa Emoz, bú onye-amuma, we kpe ekpere bayere ihe a, we tikue elu-igwe. 21 Jehova we ziga mọ-ozi, o we kpochapu ndi-dike nile bu dìnkpà, na ndi-ndú na ndi-isi, n'ọmuma-ulo-ikwū nke eze Asiria. O we were ihere iru laghachi n'ala-ya. O we ba n'ulo chi-ya, ndi siri na ngiri-afọ-ya we were mma-agha me ka ọ da nwua n'ebe ahu. 22 Jehova we zọputa Hezekaia na ndi bi na Jerusalem n'aka Senakerib, bú eze Asiria, na n'aka madu nile, we nēdu ha buruburu. 23 Ọtutu madu nēbute-kwa-ra Jehova onyinye-inata-iru-ọma, rue Jerusalem, ha nēbute-kwa-ra Hezekaia, bú eze Juda, ihe di oké ọnu-ahia: ewe bulie ya elu n'anya mba nile mb͕e ihe ndia gasiri. 24 Na mb͕e ahu Hezekaia riara ọria rue inwu: o we kpere Jehova; O we gwa ya okwu, nye ya ihe-ebube. 25 Ma ọ bughi dika nmeso emesoro ya ka Hezekaia nyeghachiri; n'ihi na obi-ya di elu: iwe we dikwasi ya, dikwasi kwa Juda na Jerusalem. 26 Hezekaia we ruru ala n'ihi idi-elu nke obi-ya, ya onwe-ya na ndi bi na Jerusalem, iwe Jehova abiakwasighi kwa ha n'ubọchi Hezekaia. 27 Hezekaia we nwe àkù na nsọpuru riri nne nke-uku: o we mere onwe-ya ulo-àkù idebe ọla-ọcha, na idebe ọla-edo, na idebe nkume di oké ọnu-ahia, na idebe uda di iche iche, na idebe ọta, na idebe ihe nile anāchọsi ike; 28 o me-kwa-ra ulo nchikọbata-ihe idebe omume ọka na manya-vine ọhu na manu; na ulo anu nile ọ bula di iche iche, na ìgwè aturu n'ulo-anu. 29 O we mere onwe-ya obodo di iche iche, na ihe-nnweta, bú ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, n'uba: n'ihi na Chineke nyere ya àkù bara uba nke-uku. 30 Hezekaia nka b͕ochi-kwa-ra isi-iyi miri Gaihon di n'elu, we me ka miri ahu rùdazie n'akuku Ọdida-anyanwu obodo Devid. Ihe nāga-kwa-ra Hezekaia nke-ọma n'ọlu-ya nile. 31 Otú ọ di, n'okwu ndi-ukọ nke ndi-isi Babilon, ndi zitere ya ozi iju ajuju bayere ihe-ebude nke mere n'ala, Chineke rapuru ya inwa ya, ka O we mara ihe nile di n'obi-ya. 32 Ma ihe nile Hezekaia mere nke fọduru, na ọlu-ebere-ya nile, le, edewo ha n'ọhù Aisaia nwa Emoz, bú onye-amuma, n'akwukwọ ndi-eze Juda na Israel. 33 Hezekaia we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, ha we lìe ya n'ebe-nrigo nke ílì umu Devid. Juda nile na ndi bi na Jerusalem we mere ya ihe-nsọpuru n'ọnwu-ya. Manase nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

2 Ihe Emere 33

1 Manase b͕ara arọ iri na abua mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze ọgu arọ abua na iri na ise nime Jerusalem. 2 O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di, bú ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel. 3 Ebe di elu nke Hezekaia nna-ya kwaturu, o wue ha ọzọ; o guzo-kwa-ra ebe-ichu-àjà nye Bealim, me kwa Asherot, kpọ kwa isi ala nye usu nile nke ihe elu-igwe, fè ha òfùfè. 4 O wu-kwa-ra ebe-ichu-àjà di iche iche n'ulo Jehova, nke Jehova siri, Nime Jerusalem ka aham gādi rue mb͕e ebighi-ebi. 5 O wu-kwa-ra ebe-ichu-àjà nye usu nile nke ihe elu-igwe n'ogige abua nke ulo Jehova. 6 Onye ahu me-kwa-ra ka umu-ya ndikom gabiga nime ọku nime ndagwurugwu nwa Hinom: o ji-kwa-ra igwe-oji tu isi ọma na isi ọjọ, ọ b͕a-kwa-ra afa, me ihe-mb͕asi, meso onye nāju mọ ihe na ndi-dibia-afa: o mere ihe jọrọ njọ n'anya Jehova ri nne, ikpasu Ya iwe. 7 Ọ dọba-kwa-ra arusi apiri api nke oyiyi-ihe ahu, bú nke o mere, n'ulo Chineke, bú nke Chineke siri Devid, si kwa Solomon nwa-ya, Ṅ'ulo a, na nime Jerusalem, nke M'rọputaworo n'ebo nile nke Israel, ka M'gētiye aham rue mb͕e ebighi-ebi: 8 M'gaghi-esi kwa n'elu ala nke M'guzoro nye nna-unu-hà wezuga ukwu Israel ọzọ: nání ọ buru na ha elezi anya ime nile nke M'nyeworo ha n'iwu, bú iwu ahu nile na ukpuru nile na ikpé nile nke sitere n'aka Moses. 9 Manase we me ka Juda na ndi bi na Jerusalem sihie uzọ, ime ihe ọjọ kari mba ọzọ, bú ndi Jehova kpochapuru n'iru umu Israel. 10 Jehova we gwa Manase okwu, gwa kwa ndi-ya: ma ha aṅaghi nti. 11 Jehova we me ka ndi-isi usu-ndi-agha nke eze Asiria nwere biakwasi ha, ha we jide Manase n'ọhia-ogwu, were ihe ọla eji ke ukwu ab͕u ke ya ab͕u, me ka o jerue Babilon. 12 Ma mbe anākpab͕u ya, ọ chọ ka iru Jehova, bú Chineke-ya, dajua, we ruru ala nke-uku n'iru Chineke nke nna-ya-hà. 13 O we kpere Ya; O we kwe ka ọ riọta ihe ọ riọrọ, we nuru aririọ-amara-ya, me ka ọ lata na Jerusalem ba n'ala-eze-ya. Manase we mara na Jehova, Ya onwe-ya, bu Chineke. 14 Mb͕e ihe ndia gasiri, o wuere obodo Devid mb͕idi n'azu mb͕idi-ya, n'akuku Ọdida-anyanwu nke Gaihon, nime ndagwurugwu, we rue nbata n'ọnu-uzọ-ama azù; ọ b͕a kwa Ofel buruburu, me ka ọ di elu nke-uku: o do-kwa-ra ndi-isi usu-ndi-agha n'obodo nile ewusiri ike nime Juda. 15 O wezuga-kwa-ra chi nile nke ala ọzọ, si kwa n'ulo Jehova wezuga oyiyi-ihe ahu, ya na ebe-ichu-àjà nile nke o wuru n'ugwu ulo Jehova, na nime Jerusalem, o kpofue ha n'azu obodo. 16 O wue ebe-ichu-àjà Jehova, chua n'elu ya àjà, bú àjà-udo na àjà-ekele, ọ si Juda ka ha fè Jehova, bú Chineke Israel, òfùfè. 17 Otú ọ di, ndi Juda nọ nāchu àjà n'ebe di elu nile, ma ọ bu nání nye Jehova, bú Chineke-ha. 18 Ma ihe nile Manase mere nke fọduru, na ekpere-ya o kpere Chineke-ya, na okwu nile nke ndi-ọhu-uzọ, bú ndi gwara ya okwu n'aha Jehova, bú Chineke Israel, le, edewo ha n'akwukwọ ihe ndi-eze Israel mere. 19 Ekpere-ya kwa, na otú ekwere ka ọ riọta ìhe, na nmehie-ya nile, na nmekpu-ya, na ebe nile nke o wuru ebe di elu nime ha, guzo kwa Asherim na arusi apiri api, tutu o ruru ala: le, edewo ha n'akwukwọ okwu Hozai. 20 Manase we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, ha we lìe ya, n'ulo-ya: Emon nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya. 21 Emon b͕ara orú arọ na abua mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ abua nime Jerusalem. 22 O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika Manase, bú nna-ya, mere: Emon we chuara arusi nile apiri api, bú nke Manase nna-ya mere, àjà, we fè ha òfùfè. 23 Ma o rurughi ala n'iru Jehova, dika Manase, bú nna-ya, ruru ala; kama Emon nka mere ka ikpe ma ya ri nne. 24 Ndi-orù-ya we kekọta onwe-ha imegide ya, ha we me ka ọ nwua n'ulo-ya. 25 Ndi ala ahu we tib͕ue ndi nile nēkekọta onwe-ha imegide eze, bú Emon: ndi ala ahu we me Josaia nwa-ya eze n'ọnọdu ya.

2 Ihe Emere 34

1 Josaia b͕ara arọ asatọ mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze orú arọ na iri na otù nime Jerusalem. 2 O me ihe ziri ezi n'anya Jehova, je ije n'uzọ nile nke Devid nna-ya, o wezugaghi kwa onwe-ya n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe. 3 Ma n'arọ nke-asatọ nke ọ bu eze, mb͕e ya onwe-ya nọ na nwata, ọ malitere ichọ Chineke nke Devid nna-ya: n'arọ nke-iri-na-abua ka ọ malite-kwa-ra ime Juda na Jerusalem ka ha di ọcha pua n'ebe di elu nile, na Asherim, na arusi nile apiri api, na arusi nile awuru awu. 4 Ha we kwatue ebe-ichu-àjà Bealim n'iru ya; o b͕utue arusi-anyanwu nile, nke di n'ebe di elu n'elu ugwu; o tipia-kwa-ra Asherim, na arusi nile apiri api, na arusi nile awuru awu, ọ supia ha, fesa n'elu ílì ndi nāchuru ha àjà. 5 O sure ọkpukpu nke ndi-nchu-àjà n'elu ebe-ichu-àjà-ha, me ka Juda na Jerusalem di ọcha. 6 O me-kwa-ra otú a n'obodo nile nke Manase na Efraim na Simeon, we rue Naftali, nime nkpọnkpọ-ebe-ha nile buruburu. 7 Ọ kwatue ebe-ichu-àjà nile, tipia Asherim na arusi nile apiri api, ha we ghọ uzuzu, o b͕utu-kwa-ra arusi-anyanwu nile n'ala Israel nile, we lata na Jerusalem. 8 Ma n'arọ nke-iri-asatọ nke ọ bu eze, mb͕e ọ mesiri ka ala-ya na ulo ahu di ọcha, o zigara Shefan nwa Azalia, na Maaseia, bú onye-isi obodo ahu, na Joa nwa Joahaz, bú onye-ncheta, ime ulo Jehova, bú Chineke, ka ọ di ike. 9 Ha we biakute Hilkaia, bú onye-isi-nchu-àjà, nye ya ego ahu nke anēwebata n'ulo Chineke, nke ndi Livai, bú ndi nēche nbata-uzọ, chikọtara n'aka ndi Manase na Efraim, na n'aka ndi nile fọduru nke Israel, na n'aka Juda na Benjamin nile na ndi bi na Jerusalem. 10 Ha we nye ya n'aka ndi nēje ozi ahu, bú ndi nēlekọta ihe n'ulo Jehova; ndi nēje ozi ahu, bú ndi nālu ọlu n'ulo Jehova, we nye ya iji mezi ebe etipúru etipú na ime ka ulo ahu di ike; 11 ha we nye ya ndi-ọ̀kà n'osisi, nye kwa ndi nēwu ulo, iji zuta nkume awara awa, na osisi iji me ihe-njikọta, na ijikọta ulo nile nke ndi-eze Juda bibiri. 12 Ndikom ahu nālu ọlu n'ikwesi-ntukwasi-obi n'ozi ahu: ndi-nlekọta-ha bu kwa Jahat na Obadaia, ndi Livai, ndi sitere n'umu Merari; na Zekaraia na Meshulam, ndi sitere n'umu ndi Kohat, ibu ndi-isi: na ndi Livai ọzọ, bú ndi nile nwere nghọta n'ihe abù. 13 Ha bu kwa ndi-isi nke ndi-ibu, ha nēdu kwa ndi nile nēje ozi ifè òfùfè ọ bula: ufọdu nime ndi Livai bu kwa ndi-ode-akwukwọ, na ndi-odozi-okwu, na ndi-ọnu-ama. 14 Ma mb͕e ha nēweputa ego ahu nke anēwebata n'ulo Jehova, Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, chọtara akwukwọ iwu Jehova nke enyere site n'aka Moses. 15 Hilkaia we za, si Shefan, bú ode-akwukwọ, Achọtawom akwukwọ iwu ahu n'ulo Jehova. Hilkaia we nye Shefan akwukwọ ahu. 16 Shefan we būru akwukwọ ahu biakute eze, ọzọ kwa, o weghachiri eze okwu, si, Ihe nile enyere n'aka ndi-orù-gi, ha nēme ya. 17 Ha awupuwo kwa ego nke anāchọta n'ulo Jehova, ha we nye ya n'aka ndi-nlekọta ahu, na n'aka ndi nēje ozi ahu. 18 Shefan, bú ode-akwukwọ, we gosi eze, si, Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, enyewom otù akwukwọ. Shefan we gua ya n'iru eze. 19 O rue, mb͕e eze nuru okwu nile nke iwu ahu, na ọ dọwara uwe-ya nile. 20 Eze we nye Hilkaia, na Ahaikam nwa Shefan, na Abdon nwa Maika, na Shefan, bú ode-akwukwọ, na Asaia, bú orù eze, iwu, si, 21 Jenu, juaram Jehova ase, ju-kwa-ra ndi fọduru n'Israel na nime Juda, bayere okwu nile nke akwukwọ a nke achọtaworo: n'ihi na ọnuma Jehova di uku, bú nke awusaworo ayi, n'ihi na nna-ayi-hà edebeghi okwu Jehova, ime dika ihe nile si di nke edeworo n'akwukwọ a. 22 Hilkaia, na ndi ahu eze gwara, we jekuru Hulda, bú onye-amuma-nwayi, nwunye Shalum nwa Tokhat, nwa Hasra, onye nēdebe uwe ndi-nchu-àjà; (ma nwayi ahu nēbi na Jerusalem n'obodo nke-abua; ) ha we gwa ya okwu otú a. 23 Ọ si ha, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri: Sinu nwoke ahu nke ziri unu biakutem, 24 Otú a ka Jehova siri, Le, M'nēme ka ihe ọjọ biakwasi ebe a, biakwasi kwa ndi bi nime ya, bú nkọcha nile nke edeworo n'akwukwọ ahu nke ha guworo n'iru eze Juda: 25 n'ihi na ha arapuwom, we surere chi di iche iche ọzọ ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ka ha we were ọlu nile nke aka-ha kpasuem iwe; ewe wusa ọnumam n'ebe a, agaghi-emenyu kwa ya. 26 Ma eze Juda, onye nēzite unu iju Jehova ase, otú a ka unu gāsi ya, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri: Okwu ndia nke i nuworo, 27 n'ihi na obi-gi di nrò, i we ruru ala n'iru Chineke, mb͕e i nuru okwu-Ya nile megide ebe a, megide kwa ndi bi nime ya, i we ruru ala n'irum, dọwa kwa uwe-gi nile, kwa ákwá n'irum; Mu onwem anuwo kwa, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 28 Le, M'gāchikọta gi na nna-gi-hà n'ala-mọ, agāchikọta kwa gi na ndi ọzọ je n'ílì-gi n'udo, anya-gi agaghi-ele kwa ihe ọjọ a nile nke Mu onwem nēme ka ọ biakwasi ebe a, biakwasi kwa ndi bi nime ya. Ha we weghachiri eze okwu. 29 Eze we ziga, chikọta ndi-okenye nile nke Juda na Jerusalem. 30 Eze we rigorue ulo Jehova, ya na ndikom nile nke Juda, na ndi bi na Jerusalem, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na ndi Juda nile, site n'onye uku we rue onye ntà; o we gua na nti-ha okwu nile nke akwukwọ ọb͕ub͕a-ndu ahu nke achọtaworo n'ulo Jehova. 31 Eze we guzo n'ọnọdu-ya, b͕a ndu n'iru Jehova, ijeso Jehova, na iwere obi-ya nile na nkpuru-obi-ya nile debe ihe nile O nyere n'iwu, na ihe-àmà-Ya nile, na ukpuru-Ya nile, ime okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu nka nke edeworo n'akwukwọ a. 32 O we me onye ọ bula ahuru na Jerusalem na Benjamin ka o guzo. Ndi bi na Jerusalem we me dika ọb͕ub͕a-ndu Chineke si di, bú Chineke nke ndi bu nna-ha. 33 Josaia we si n'ala nile nke umu Israel nwere wezuga ihe-árú nile, me ndi nile ahuru n'Israel ka ha fè òfùfè, ọbuná ifè Jehova, bú Chineke-ha, òfùfè. Ubọchi-ya nile ha esighi n'iso Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, wezuga onwe-ha.

2 Ihe Emere 35

1 Josaia we mere Jehova ememe ngabiga nime Jerusalem: ha we b͕ue anu ngabiga n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa mbu. 2 O we guzo ndi-nchu-àjà n'ihe-ndebe nile ha, me ka ha di ike ifè òfùfè ulo Jehova. 3 Ọ si ndi Livai, bú ndi nēme Israel nile ka ha ghọta ihe, ndi di nsọ n'ebe Jehova nọ, Tiyenu ib͕e nsọ n'ulo ahu nke Solomon nwa Devid, bú eze Israel, wuru; ibu agaghi-adiri unu n'ubu: ub͕u a fènu Jehova, bú Chineke-unu, na ndi-Ya, bú Israel, òfùfè. 4 Dozi-kwa-nu onwe-unu dika ulo nna-unu-hà si di n'òkè nile unu, dika odide-akwukwọ Devid, bú eze Israel, si di, na dika odide-akwukwọ Solomon nwa-ya si di. 5 Guzo-kwa-nu n'ebe nsọ dika nkewa nile nke ulo nke ndi bu nna umu-nne-unu si di, bú umu ndi Israel, na òkè ulo nna ndi Livai. 6 B͕u-kwa-nu anu ngabiga, do kwa onwe-unu nsọ, dozi-kwa-ra umu-nne-unu ihe, ime dika okwu Jehova, site n'aka Moses, si di. 7 Josaia we bulie nye umu ndi Israel, bú ndi nile ahuru n'ebe ahu, ìgwè ewu na aturu, bú umu-aturu na umu-ewu, ha nile bu iji chu àjà-ngabiga, ọnu-ọgugu-ha ra ka orú nnù uzọ atọ na nnù iri-na-ise, na nnù oké-ehi asa na ọgu iri: ndia sitere n'àkù eze. 8 Ndi-isi-ya buli-kwa-ra onyinye-afọ-ofufo nye ndi ahu, bú ndi-nchu-àjà na ndi Livai. Hilkaia na Zekaraia na Jehiel, bú ndi-ndú ulo Chineke, nyere ndi-nchu-àjà nnù ewu na aturu isi na ọgu iri, na ọgu ehi iri-na-isi, iji chu àjà-ngabiga. 9 Konanaia kwa, na Shemaia na Netanel, bú umu-nne-ya, na Hashabaia na Jeiel na Jozabad, bú ndi-isi nke ndi Livai, buliri nye ndi Livai nnù ewu na aturu iri-na-abua na ọgu iri, na nnù ehi na ọgu ise, iji chu àjà-ngabiga. 10 Ewe dozie òfùfè ahu, ndi-nchu-àjà we guzo n'ebe-nguzo-ha, na ndi Livai n'òkè nile ha, dika ihe eze nyere n'iwu si di. 11 Ha we b͕ue anu ngabiga ahu, ndi-nchu-àjà we wusa ọbara nke ha natara n'aka-ha, ndi Livai we nāb͕a akpukpọ-ha. 12 Ha we wezuga àjà-nsure-ọku, inye ha dika nkewa nile nke ulo nke ndi bu nna umu ndi Israel si di, iweta ha nso Jehova, dika edeworo ya n'akwukwọ Moses. Otú a ka eme-kwa-ra ehi. 13 Ha we were ọku sie anu ngabiga dika ikpé-ya si di: ma ha siri ihe nsọ ọzọ nile n'ite, na n'ite isi miri, na n'ite-ofé, būru ha b͕akuru umu ndi Israel nile. 14 Emesia ha we doziere onwe-ha, dozi-kwa-ra ndi-nchu-àjà; n'ihi na ndi-nchu-àjà, bú umu Eron, nọ n'isure àjà-nsure-ọku na abuba rue abali: ndi Livai we doziere onwe-ha, dozi-kwa-ra ndi-nchu-àjà, bú umu Eron. 15 Ndi-ọbù-abù, bú umu Esaf, nọ kwa n'ebe-nguzo-ha, dika ihe Devid, na Esaf, na Himan, na Jedutun, bú onye-ọhu-uzọ eze, nyere n'iwu si di; ndi-ọnu-uzọ-ama nọ kwa n'ọnu-uzọ-ama nile ọ bula: ha enweghi ike isi n'òfùfè-ha wezuga onwe-ha, kama umu-nne-ha, bú ndi Livai, doziri ihe nye ha. 16 Ewe dozie òfùfè nile nke Jehova n'ubọchi ahu, ime ememe ngabiga, na isure àjà-nsure-ọku n'elu ebe-ichu-àjà nke Jehova, dika ihe eze, bú Josaia, nyere n'iwu si di. 17 Umu Israel ndi ahuru n'ebe ahu we me ememe ngabiga na mb͕e ahu, na ememe achicha ekoghi-eko ubọchi asa. 18 Emeghi kwa ememe ngabiga dika nka n'Israel site n'ubọchi Samuel, bú onye-amuma; ọ dighi kwa eze Israel ọ bula mere ememe ngabiga dika ememe ngabiga ahu nke Josaia mere, ya na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na Juda na Israel nile ahuru n'ebe ahu, na ndi bi na Jerusalem. 19 ọ bu n'arọ nke-iri-na-asatọ nke ọbubu-eze Josaia ka emere ememe ngabiga nka. 20 Mb͕e ihe a nile gasiri, mb͕e Josaia dozisiri ulo Chineke, Neko, bú eze Ijipt, rigoro ibuso Kakemish n'akuku Yufretis agha: Josaia we pua izute ya. 21 O we zigara ya ndi-ozi, si, Gini ka mu na gi nwekọrọ, eze Juda? ọ bughi imegide gi onwe-gi ka m'biaworo ta, kama ijekuru ulo ahu nke m'nēbuso ha agha: ma Chineke siri ka m'me ngwa: gi onwe-gi ra aka-gi n'ebe Chineke nọ, Onye nọyerem, ka Ọ ghara ibibi gi. 22 Ma Josaia esighi n'ebe ọ nọ chigharia iru-ya, kama o nwoghariri onwe-ya ibuso ya agha, ọ geghi kwa nti okwu Neko, bú nke sitere n'ọnu Chineke, o we bia ibu agha nime ndagwurugwu Megido. 23 Ndi-ọb͕a-uta we b͕a eze, bú Josaia; eze we si ndi-orù-ya, Bubiganum; n'ihi na ọria nāriam nke-uku. 24 Ndi-orù-ya we si n'ub͕ọ-ala ahu bubiga ya, me ka ọ nọdu n'ub͕ọ-ala nke-abua nke o nwere, ha we me ka o jerue Jerusalem; o we nwua, elìe ya n'ílì nna-ya-hà. Juda na Jerusalem nile we ruere Josaia újú. 25 Jeremaia we bùara Josaia abù-ákwá: ndi-abù ndikom na ndi-abù ndinyom nile we nēkwu okwu bayere Josaia rue ta n'abù-ákwá-ha; ha we tiye ha ibu ukpuru n'ebe Israel nọ: ma, le, edewo ha n'akwukwọ abù-ákwá. 26 Ma ihe nile Josaia mere nke fọduru, na ọlu-ebere-ya nile, dika ihe edeworo n'iwu Jehova si di, 27 na ihe nile o mere, nke-mbu na nke-ikpe-azu, le, edewo ha n'akwukwọ ndi-eze Israel na Juda.

2 Ihe Emere 36

1 Ndi ala ahu we kuru Jehoahaz nwa Josaia, me ya eze n'ọnọdu nna-ya nime Jerusalem. 2 Joahaz b͕ara orú arọ na atọ mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze ọnwa atọ nime Jerusalem. 3 Eze Ijipt we wezuga ya nime Jerusalem, rie ala ahu nra ọgu talent ọla-ọcha ise na otù talent ọla-edo. 4 Eze Ijipt we me Elaiakim, bú nwa-nne-ya, eze Juda na Jerusalem, gugharia ya aha Jehoiakim. Neko we were Joahaz nwa-nne-ya, me ka ọ biarue Ijipt. 5 Jehoiakim b͕ara orú arọ na ise mb͕e ọ malitere ibu eze: o we buru eze arọ iri na otù nime Jerusalem: o me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, bú Chineke-ya. 6 Nebukadneza, bú eze Babilon, we rigota imegide ya, were ihe ọla eji ke ukwu ab͕u ke ya ab͕u, ime ka o jerue Babilon. 7 Nebukadneza we chiri ufọdu n'ihe ulo Jehova chibata na Babilon, o tiye ha n'ulo uku ya nime Babilon. 8 Ma ihe nile Jehoiakim mere nke fọduru, na ihe-árú-ya nile nke o mere, na ihe achọputaworo imegide ya, le, edewo ha n'akwukwọ ndi-eze Israel na Juda: Jehoiakin nwa-ya we buru eze n'ọnọdu-ya. 9 Jehoiakin b͕ara arọ asatọ mb͕e ọ malitere ibu eze: o we buru eze ọnwa atọ na ubọchi iri nime Jerusalem: o me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova. 10 Ma n'ọb͕ub͕a arọ, eze, bú Nebukadneza, zìri, me ka ọ biarue Babilon, ya na ihe nile anāchọsi ike nke ulo Jehova, o we me Zedakaia, bú nwa-nne-ya, eze Juda na Jerusalem. 11 Zedekaia b͕ara orú arọ na otù mb͕e ọ malitere ibu eze: o we buru eze arọ iri na otù nime Jerusalem: 12 o me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, bú Chineke-ya; o rurughi ala n'iru Jeremaia, bú onye-amuma, onye nēkwu okwu site n'ọnu Jehova. 13 Ọzọ kwa, o nupuru isi n'okpuru eze, bú Nebukadneza, onye mere ka o were Chineke ṅua iyi: o we kwesie olu-ya ike, b͕a obi-ya ume, ka ọ ghara ichigharikute Jehova, bú Chineke Israel. 14 Ndi-isi nile nke ndi-nchu-àjà, na ndi Juda, mekpu-kwa-ra ihe-nmekpu ri nne, dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di; ha we merua ulo Jehova nke O doro nsọ nime Jerusalem. 15 Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, we zigara ha ozi n'aka ndi-ozi-Ya, nēbili n'isi-ututu, nēzì kwa; n'ihi na O nwere ọmiko n'aru ndi-Ya na n'ebe ebe-obibi-Ya di: 16 ha we nēme ndi-ozi Chineke ka ha buru ihe-ọchì, ha nēlelì kwa okwu-Ya anya, nēme kwa onwe-ha ndi-aghughọ n'ebe ndi-amuma-Ya nọ, rue mb͕e ọnuma Jehova lara elu imegide ndi-Ya, rue mb͕e ngwọta nādighi. 17 O we me ka eze Kaldea rigokwasi ha, o we were mma-agha b͕ue umu-okorọbia-ha n'ulo ebe nsọ ha, o nweghi kwa ọmiko n'aru nwa-okorọbia, ma ọbu n'aru nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, ma-ọbu n'aru okenye, ma-ọbu n'aru onye kara nká: ha nile ka O nyere n'aka-ya. 18 Ihe nile nke ulo Chineke, ihe uku na ihe ntà, na àkù nile nke ulo Jehova, na àkù nile nke eze na ndi-isi-ya; ihe ndia nile ka ọ chibatara na Babilon. 19 Ha we sure ulo Jehova ọku, kwatu kwa mb͕idi Jerusalem, sure kwa ulo-elu-ya nile n'ọku, na ihe-ya nile anāchọsi ike, ibibi ha. 20 O me ndi fọduru site na mma-agha ka ha je biri na Babilon; ha we ghọrọ ya, ghọ-kwa-ra umu-ya, ndi-orù rue ọbubu-eze ala-eze Peasia: 21 imezu okwu Jehova nke sitere n'ọnu Jeremaia, rue mb͕e ubọchi-izu-ike-ya nile tọsiri ala ahu utọ: ubọchi nile nke ntọb͕ọrọ-n'efu-ya ọ kwusiri ọlu, imezu ọgu arọ atọ na iri. 22 Ma n'arọ mbu nke Sairọs, bú eze Peasia, ka okwu Jehova nke sitere n'ọnu Jeremaia we rè, Jehova kpọtere mọ nke Sairọs, bú eze Peasia, o we kwusa n'ala-eze-ya nile, ọzọ kwa, o tiyere ya n'odide-akwukwọ, si, 23 Otú a ka Sairọs, bú eze Peasia, siri, Ala-eze nile nke uwa ka Jehova, bú Chineke elu-igwe, nyeworom; Ya onwe-ya me-kwa-ram ka m'buru onye-nlekọta n'iwuru Ya ulo nime Jerusalem, nke di na Juda. Ònye nọ n'etiti unu site na ndi-Ya nile? ka Jehova, bú Chineke-ya, nọyere ya, ya rigo kwa.

Ezra 1

1 Ma n'arọ mbu nke Sairọs, bú eze Peasia, ka okwu Jehova nke sitere n'ọnu Jeremaia we rè, Jehova kpọtere mọ nke Sairọs, bú eze Peasia, o we kwusa n'ala-eze-ya nile, ọzọ kwa, o tiyere ya n'odide-akwukwọ, si, 2 Otú a ka Sairọs, bú eze Peasia, siri, Ala-eze nile nke uwa ka Jehova, bú Chineke elu-igwe, nyeworom; Ya onwe-ya me-kwa-ram ka m'buru onye-nlekọta n'iwuru Ya ulo nime Jerusalem, nke di na Juda. 3 Ònye nọ n'etiti unu site na ndi-Ya nile? ka Chineke-ya nọyere ya, ya rigoru kwa Jerusalem, wue ulo Jehova, bú Chineke Israel, (Ya onwe-ya bu Chineke, ) nke di na Jerusalem. 4 Ma onye ọ bula nke fọduru afọdu, site n'ebe nile ebe onye ahu nọ dika ọbìa, ka ndikom nke ebe-ya were ọla-ọcha na ọla-edo na àkù na anu-ulo, ya na onyinye-afọ-ofufo-ha nke diri ulo Chineke nke di na Jerusalem, yere ya aka. 5 Ndi-isi ulo nke ndi bu nna Juda na Benjamin, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, bú onye ọ bula Chineke kpọtere mọ-ya, we bilie irigo iwu ulo Jehova nke di na Jerusalem. 6 Ndi nile nke nọ ha buruburu we were ihe ọla-ọcha na ọla-edo na àkù na anu-ulo na ihe di oké ọnu-ahia, nāgughi ihe nile enyere n'afọ-ofufo, me ka aka-ha di ike. 7 Eze, bú Sairọs, chiputa-kwa-ra ihe ulo Jehova, nke Nebukadneza chipuru na Jerusalem tiye n'ulo ndi-chi-ya: 8 Sairọs, bú eze Peasia, we chiputa ha site n'aka Mitredat, bú odozi-àkù, gua ha nye Sheshbaza, bú onye-isi Juda. 9 Nka bu kwa ọnu-ọgugu-ha: orú ọkwa ọla-edo na iri, na nnù ọkwa ọla-ọcha abua na ọgu iri, na orú mma na iteghete; 10 orú ọkwa ntà ọla-edo na iri, na nnù ọkwa ntà ọla-ọcha na iri nke-abua di iche, na nnù ihe ọzọ abua na ọgu iri. 11 Ihe nile nke ọla-edo na nke ọla-ọcha di nnù iri-na-atọ na ọgu iri. Ha nile ka, Sheshbaza chigotara, mb͕e ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ siri na Babilon rigorue Jerusalem.

Ezra 2

1 Ma ndia bu umu ala ahu anāchi achi ndi nārigo, bú ndi sitere na ndọta-n'agha ahu nke ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ndi Nebukadneza, bú eze Babilon, mere ka ha je biri na Babilon, ha we laghachi na Jerusalem na Juda, nwoke ọ bula n'obodo-ya; 2 ndi ahu soro Zerubabel bia: bú Jeshua, Nehemaia, Seraia, Reelaia, Mọdekai, Bishan, Mispa, Bigvai, Rehum, Beana. Ọnu-ọgugu ndikom nke ndi Israel: 3 umu Parosh, nnù ise na ọgu asatọ na iri na abua. 4 Umu Shefataia, ọgu iri-na-asatọ na iri na abua. 5 Umu Ara, nnù na ọgu iri-na-asatọ na iri na ise. 6 Umu Pahat-moab, nke umu Jeshua na Joab, nnù asa na iri na abua. 7 Umu Ilam, nnù atọ na ọgu abua na iri na anọ. 8 Umu Zatu, nnù abua na ọgu asa na ise. 9 Umu Zakai, nnù na ọgu iri-na-asatọ. 10 Umu Bani, nnù na ọgu iri-na-abua na abua. 11 Umu Bebai, nnù na ọgu iri-na-otù na atọ. 12 Umu Azgad, nnù atọ na orú na abua. 13 Umu Adonikam, nnù na ọgu iri-na-atọ na isi. 14 Umu Bigvai, nnù ise na ọgu abua na iri na isi. 15 Umu Adin, nnù na ọgu abua na iri na anọ. 16 Umu Atea, nke Hezekaia, ọgu anọ na iri na asatọ. 17 Umu Bezai, ọgu iri-na-isi na atọ. 18 Umu Jora, ọgu ise na iri na abua. 19 Umu Hashum, ọgu iri-na-otù na atọ. 20 Umu Giba, ọgu anọ na iri na ise. 21 Umu Bet-lehem, ọgu isi na atọ. 22 Ndikom Netofa, ọgu abua na iri na isi. 23 Ndikom Anatot, ọgu isi na asatọ. 24 Umu Azmavet, ọgu abua na abua. 25 Umu Kiriat-arim na Kefira na Beirot, nnù na ọgu iri-na-asa na atọ. 26 Umu Rema na Geba, nnù na ọgu iri-na-otù na otù. 27 Ndikom Mikmas, ọgu isi na abua. 28 Ndikom Bet-el na Ai, ọgu iri-na-otù na atọ. 29 Umu Nebo, ọgu abua na iri na abua. 30 Umu Magbish, ọgu asa na iri na isi. 31 Umu Ilam nke-ọzọ, nnù atọ na ọgu abua na iri na anọ. 32 Umu Harim, ọgu iri-na-isi. 33 Umu Lod na Hadid na Ono, nnù na ọgu iri-na-isi na ise. 34 Umu Jeriko, ọgu iri-na-asa na ise. 35 Umu Senaa, nnù iteghete na orú na iri. 36 Ndi-nchu-àjà: umu Jedaia, nke ulo Jeshua, nnù abua na ọgu asatọ na iri na atọ. 37 Umu Imea, nnù abua na ọgu iri-na-abua na iri na abua. 38 Umu Pashua, nnù atọ na ọgu abua na asa. 39 Umu Harim, nnù abua na ọgu iri na iri na asa. 40 Ndi Livai: umu Jeshua na Kadmiel, nke umu Hodavaia, ọgu atọ na iri na anọ. 41 Ndi-ọbù-abù: umu Esaf, ọgu isi na asatọ. 42 Umu ndi-ọnu-uzọ-ama: umu Shalum, na umu Atea, na umu Talmon, na umu Akub, na umu Hatita, na umu Shobai, ha nile di ọgu isi na iri na iteghete. 43 Netinim: umu Ziha, na umu Hasufa, na umu Tabaot; 44 na umu Kiros, na umu Siaha, na umu Padon; 45 na umu Lebana, na umu Hagaba, na umu Akub; 46 na umu Hagab, na umu Shamlai, na umu Hanan; 47 na umu Gidel, na umu Gaha, na umu Reaia; 48 na umu Rezin, na umu Nekoda, na umu Gazam; 49 na umu Uza, na umu Pasea, na umu Besai; 50 na umu Asna, na umu Meunim, na umu Nefisim; 51 na umu Bakbuk, na umu Hakufa, na umu Hahua; 52 na umu Bazlut, na umu Mehida, na umu Hasha; 53 na umu Bakos, na umu Sisera, na umu Tema; 54 na umu Nezia, na umu Hatifa. 55 Umu ndi-orù Solomon: umu Sotai, na umu Hasoferet, na umu Peruda; 56 na umu Jaala, na umu Dakon, na umu Gidel; 57 na umu Shefataia, na umu Hatil, na umu Pokeret-hazébaim, na umu Ami. 58 Netinim nile, na umu ndi-orù Solomon, di ọgu iri-na-iteghete na iri na abua. 59 Ndia bu kwa ndi nārigo site na Tel-mela na Tel-hasha na Kerub na Adan na Imea: ma ha apughi igosi ulo nke ndi bu nna-ha, na nkpuru-ha, ma ọ bu Israel ka ha siri puta: 60 umu Delaia, na umu Tobaia, na umu Nekoda, nnù na ọgu iri-na-abua na iri na abua. 61 Site kwa n'umu ndi-nchu-àjà: umu Habaia, na umu Hakoz, na umu Bazilai, onye luru nwunye sitere n'umu-ndinyom Bazilai, bú onye Gilead, ewe kpọ ya aha n'aha-ha. 62 Ndia chọrọ odide-akwukwọ-ha n'etiti ndi edere n'akwukwọ-osuso-ọmumu, ma achọtaghi ha: ewe gua ha na ndi nādighi nsọ, ewe wepu ha n'ọlu-nchu-àjà. 63 Tiashata we si ha, ka ha ghara iri ihe n'ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile, rue mb͕e onye-nchu-àjà gēwere Ìhè na Izu-okè guzo. 64 Nkpọkọta ahu nile n'otù di orú nnù uzọ ise na nnù ise na ọgu iri-na-asatọ, 65 nāgughi orù-ha ndikom na orù-ha ndinyom, ndi di nnù iri-na-asatọ na ọgu isi na iri na asa: ha nwe-kwa-ra ọgu madu iri, bú ndikom nābù abù na ndinyom nābù abù. 66 Inyinya-ha di nnù na ọgu iri-na-isi na iri na isi; inyinya mule ha di ọgu iri-na-abua na ise; 67 camel-ha di nnù na orú na iri na ise; inyinya-ibu-ha di nnù iri-na-isi na ọgu iri-na-isi. 68 Ma ufọdu n'etiti ndi-isi ulo nke ndi bu nna, mb͕e ha biaruru ulo Jehova nke di na Jerusalem, ha nyere onwe-ha n'afọ-ofufo iwu ulo Chineke ime ka o guzo n'ọnọdu-ya: 69 dika ike-ha si di ka ha tiyere n'ulo-àkù nke ije-ozi ahu orú nnù daric ọla-edo uzọ asa na nnù iri-na-abua na ọgu iri, na nnù pound ọla-ọcha iri-na-abua na ọgu iri, na ọgu uwe ndi-nchu-àjà ise. 70 Ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na ufọdu nime ndi Juda, na ndi-ọbù-abù, na ndi-ọnu-uzọ-ama, na Netinim, we biri n'obodo nile ha, Israel nile bi-kwa-ra n'obodo nile ha.

Ezra 3

1 Ọnwa nke-asa we rue, umu Israel nọ kwa n'obodo nile ha, ndi ahu we chikọta onwe-ha dika otù onye rue Jerusalem. 2 Jeshua nwa Jozadak, na umu-nne-ya, bú ndi-nchu-àjà, na Zerubabel nwa Shealtiel, na umu-nne-ya, we bilie, wue ebe-ichu-àjà Chineke Israel, isure àjà-nsure-ọku n'elu ya, dika edeworo ya n'iwu Moses, bú onye nke Chineke. 3 Ha we me ka ebe-ichu-àjà guzosie ike n'ebe-ndọkwasi-ya nile; nihi na oké ujọ di n'aru ha n'ihi ndi ala ahu nile: ha we surere Jehova àjà-nsure-ọku n'elu ya, bú àjà-nsure-ọku anēsure ututu na anyasi. 4 Ha we me ememe ulo-ntu, dika edeworo ya, ha we chua àjà-nsure-ọku nke ubọchi n'ubọchi-ha n'ọnu-ọgugu, dika ikpé si di, bú ihe nke ubọchi n'ubọchi-ya; 5 mb͕e ihe a gasiri ha we chua àjà-nsure-ọku nke mb͕e nile, na nke diri ọnwa ọhu, na nke diri mb͕e nile akara àkà nke Jehova, bú nke edoro nsọ, na nke diri onye ọ bula nke nēwere afọ-ofufo nye Jehova onyinye-afọ-ofufo. 6 Site n'ubọchi mbu nke ọnwa nke-asa ka ha malitere isurere Jehova àjà-nsure-ọku: ma akātọghi ntọ-ala ulo uku Jehova. 7 Ha nye kwa ndi nāwa nkume, nye kwa ndi-ọ̀kà n'osisi, ego; ha nye kwa ndi Zaidon, nye kwa ndi Taia, ihe-oriri na ihe-ọṅuṅu na manu, ka ha we si na Lebanon bute osisi cedar rue oké osimiri, rue Jafo, dika nkwenye nke Sairọs, bú eze Peasia, kweyere ha. 8 Ma n'arọ nke-abua nke ọbibia-ha nke ha biaruru ulo Chineke nime Jerusalem, n'ọnwa nke-abua, ha malitere, bú Zerubabel nwa Shealitiel, na Jeshua nwa Jozadak, na ndi fọduru n'umu-nne-ha, bú ndi-nchu-àjà na ndi Livai, na ndi nile ndi nēsi na ndọta-n'agha ahu bia na Jerusalem; ha we guzo ndi Livai, site n'onye b͕ara orú arọ ga n'iru, ibu ndi-isi n'ije-ozi nke ulo Jehova. 9 Jeshua we guzo, ya na umu-ya ndikom na umu-nne-ya, na Kadmiel na umu-ya ndikom, bú umu Juda, dika otù onye, ibu ndi-isi nke ndi nēje ozi ahu n'ulo Chineke: umu-ndikom Henadad na umu-ha ndikom ṅa umu-nne-ha, bú ndi Livai. 10 Ma mb͕e ndi nēwu ulo tọrọ ntọ-ala ulo no, uku Jehova, ha we guzo ndi-nchu-àjà n'uwe-ha chiri opì, na ndi Livai, bú umu Esaf, chiri ájà, ito Jehova, dika ukpuru Devid, bú eze Israel, si di. 11 Ha we zarita onwe-ha n'ito na n'ikele Jehova, si, N'ihi na Ọ di nma, n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di n'ebe Israel nọ. Ndi Israel nile we tie oké nkpu, mb͕e ha toro Jehova, n'ihi na atọrọ ntọ-ala ulo Jehova. 12 Ma ọtutu nime ndi-nchu-àjà na ndi Livai na ndi-isi ulo nke ndi bu nna, bú ndi-okenye ndi huru ulo mbu, mb͕e atọrọ ntọ-ala ulo a n'anya-ha, ha nākwa ákwá n'oké olu; ọtutu nọ kwa n'iti nkpu n'ọṅù, nēweli olu-ha: 13 ndi Israel amataghi kwa ihe bu olu iti-nkpu ọṅù na nke bu olu ikwa-ákwá ndi Israel: n'ihi na ndi Israel nēti oké nkpu, ewe nu olu-ya rue ebe di anya.

Ezra 4

1 Ndi nākpab͕u Juda na Benjamin we nu na umu ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ nēwuru Jehova, bú Chineke Israel, ulo uku; 2 ha we biarue Zerubabel nso, biaru kwa ndi-isi ulo nke ndi bu nna nso, si ha, Ka ayi so unu wue ulo: n'ihi na ayi nāchọ Chineke-unu, dika unu si achọ; ma ayi onwe-ayi adighi-achu àjà site n'ubọchi Isa-hadon, bú eze Asiria, onye mere ka ayi rigorue ebe a. 3 Zerubabel na Jeshua na ndi fọduru nke ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke Israel we si ha, Ọ dighi nke ayi na unu nwekọrọ n'iwuru Chineke-ayi ulo; kama ayi onwe-ayi gēwukwara Jehova, bú Chineke Israel, ulo, dika eze, bú Sairọs eze Peasia, nyere ayi iwu. 4 O rue na ndi ala ahu nēme ka aka ndi Juda ghara idi ike, ha nēme kwa ka ha tua egwu n'iwu ulo, 5 ha nēgota kwa ndi nādu ọdu megide ha, imebi idu-ọdu-ha, ubọchi nile nke Sairọs, bú eze Peasia, ọbuná rue ọbubu-eze nke Daraiọs, bú eze Peasia. 6 Ma n'ọbubu-eze Ahasuerọs, na nmalite ọbubu-eze-ya, ha dere akwukwọ-nmegide imegide ndi bi na Juda na Jerusalem. 7 N'ubọchi Ataksakses ka Bishlam na Mitredat na Tabeel na ndi-òtù-ya fọduru degara Ataksakses, bú eze Peasia, akwukwọ; ma edewo odide akwukwọ-ozi ahu n'asusu Siria, asughariwo kwa ya n'asusu Siria. 8 Rehum, bú onye-nwe ikpé, na Shimshai, bú ode-akwukwọ, degara Ataksakses, bú eze, akwukwọ-ozi imegide Jerusalem otú a: 9 mb͕e ahu ha dere akwukwọ, bú Rehum, bú onye-nwe ikpe, na Shimshai, bú ode-akwukwọ, na ndi-òtù-ha fọduru, bú ndi-Dinait, na ndi-Afasatkait, na ndi-Tapelait, na ndi-Afasait, na ni-Akevait, na ndi Babilon, na ndi Shushan, na ndi-Dehait, na ndi Ilam, 10 na mba fọduru ndi Ọsnapa di uku di kwa ebube mere ka ha bia biri n'ala a, o we me ka ha nọdu n'obodo Sameria, ha na ndi fọduru n'ofè osimiri, na ihe ọzọ di otú a. 11 Nka bu ndeputa edeputara n'akukwọ-ozi ahu nke ha zigara ya, bú Ataksakses, bú eze; Ndi-orù-gi, bú ndikom n'ofè osimiri, na ihe ọzọ di otú a. 12 Ka eze mara, na ndi-Ju, bú ndi siri n'ebe i nọ rigokute ayi, ha abawo na Jerusalem; ha nēwu obodo ahu nke nupuru isi nēsì kwa ísì, ha ewubìwo mb͕idi-ya nile, jikọta ntọ-ala-ya nile. 13 Ub͕u a, ka eze mara, na, ọ buru na ewue obodo a, wuzu kwa mb͕idi-ya nile, ọ dighi utu-ala, ma-ọbu utu-ahia, ma-ọbu utu-uzọ, ha gātu, ma n'ikpe-azu ọ gēme ka ihe funari ndi-eze. 14 Ub͕u a, n'ihi na nnú ulo uku eze bu nnú-ayi, na n'ihi na ayi enweghi ntachi-obi ihu ọtọ nke eze, ayi we zìe ozi me ka eze mara; 15 ka ewe chọ n'akwukwọ ihe-ncheta nke nna-gi-hà: i we chọta n'akwukwọ ihe-ncheta, mara kwa, na obodo a bu obodo na-enupu isi, nke nēme kwa ka ihe funari ndi-eze na ala nile anāchi achi, na ndi nākpali madu imegide ndi-isi nọ kwa n'etiti ya na mb͕e ochie: ọ bu n'ihi ya ka emere obodo a ka ọ buru nkpọnkpọ-ebe. 16 Ayi onwe-ayi nēme ka eze mara na, ọ buru na ewue obodo a, luzu kwa mb͕idi-ya nile, n'ihi ya ọ dighi òkè i gēnwe n'ofè osimiri. 17 Eze zigara Rehum, bú onye-nwe ikpé, na Shimshai, bú ode-akwukwọ, na ndi-òtù-ha fọduru ndi bi na Sameria, na ndi fọduru n'ofè osimiri, Udo, na ihe ọzọ di otú a. 18 Akwukwọ-ozi ahu nke unu zitere ayi, aguputawo ya nke-ọma n'irum. 19 M'we nye iwu, ewe chọ, chọputa na obodo a, site n'ubọchi nile nke mb͕e ochie, nēbuli onwe-ya imegide ndi-eze, anākpali kwa madu inupu isi na imegide ndi-isi nime ya. 20 Ndi-eze di ike abuwo kwa ndi-isi Jerusalem, bú ndi nwere ike n'aru ndi nile nọ n'ofè osimiri; anēnye kwa ha utu-ala na utu-ahia na utu-uzọ. 21 Ub͕u a nyenu iwu ime ka ndikom a kwusi, ka aghara kwa iwu obodo a, rue mb͕e m'gēnye iwu. 22 Lezi-kwa-nu anya ka nmehie ghara idi n'ime ihe a: n'ìhi gini ka ihe ọjọ a gādi uku ime ka ihe funari ndi-eze. 23 Mb͕e ahu site na mb͕e aguru ndeputa akwukwọ-ozi nke Ataksakses, bú eze, n'iru Rehum, na Shimshai, bú ode-akwukwọ, na ndi-òtù-ha, ha were ngwa ngwa jerue Jerusalem, jekuru ndi-Ju, were ihe-ike na usu-ndi-agha me ka ha kwusi. 24 Mb͕e ahu ọlu ulo Chineke nke di na Jerusalem kwusiri; o we kwusi rue arọ nke-abua nke ọbubu-eze nke Daraiọs, bú eze Peasia.

Ezra 5

1 Ma ndi-amuma, bú Hagai onye-amuma, na Zekaraia nwa Ido, buru amuma nye ndi-Ju ndi nọ na Juda na nime Jerusalem; ọ bu n'aha Chineke Israel ka ha buru amuma nye ha. 2 Mb͕e ahu Zerubabel nwa Shealtiel, na Jeshua nwa Jozadak, biliri, we malite iwu ulo Chineke nke di na Jerusalem; ndi-amuma Chineke nọye-kwa-ra ha, nēnye ha ume. 3 Na mb͕e ahu Tatenai, bú onye nāchi ala n'ofè osimiri, na Sheta-bozenai, na ndi-òtù-ha, biakutere ha, we si ha otú a, Ònye nyere unu iwu iwu ulo a, na iluzu mb͕idi a? 4 Mb͕e ahu otú a ka ayi siri ha. Ha siri, Òle aha ndi nēwu ulo a anēwu? 5 Ma anya Chineke-ha di n'aru ndi-okenye ndi-Ju, ha we ghara ime ka ha kwusi, rue mb͕e okwu ahu jeruru Daraiọs nti: mb͕e ahu ha we zighachi akwukwọ-ozi bayere ihe a. 6 Ndeputa akwukwọ-ozi nke Tatenai, bú onye nāchi ala n'ofè osimiri, na Sheta-bozenai, na ndi-òtù-ya, bú ndi-Afasakait, ndi nọ n'ofè osimiri, zigara Daraiọs, bú eze. 7 Ha zigara ya akwukwọ, otú a ka ede-kwa-ra nime ya; Daraiọs, bú eze, nwe akwukwọ a, udo nile diri ya. 8 Ka eze mara, na ayi jere n'ala anāchi achi, bú Juda, rue ulo Chineke uku, ma anēwere nkume nkpọrè wue ya, anēdo kwa osisi nime mb͕idi, anālu kwa ọlu a ọsọsọ, ọ nāga kwa nke-ọma n'aka-ha. 9 Mb͕e ahu ayi juru ndi-okenye ahu, si ha otú a, Ònye nyere unu iwu iwu ulo a, iluzu mb͕idi a? 10 Ọzọ kwa, ayi juru ha aha-ha, ime ka i mara, ka ayi we de aha ndikom ahu ndi bu isi-ha n'akwukwọ. 11 Ma otú a ka ha zaghachiri ayi okwu, si, Ayi onwe-ayi bu ndi-orù nke Chineke nke elu-igwe na uwa, ayi nēwu kwa ulo nke ewuru ọtutu arọ gara aga site na mb͕e a, nke otù eze uku nke Israel nwere wuru, wuzu kwa. 12 Ma mb͕e nna-ayi-hà kpasusiri Chineke nke elu-igwe iwe, O nyere ha n'aka Nebukadneza, bú eze Babilon, onye Kaldea, o we me ka ulo a la n'iyì, o me-kwa-ra ka ndi-ayi je biri na Babilon. 13 Ma n'arọ mbu nke Sairọs, bú eze Babilon, Sairọs, bú eze, nyere iwu iwu ulo Chineke a. 14 Ọzọ kwa, ihe nile nke ulo Chineke, nke ọla-edo na nke ọla-ọcha, nke Nebukadneza chiputara n'ulo uku Chineke di na Jerusalem, chibata ha n'ulo uku nke Babilon, ihe ahu ka Sairọs, bú eze, chiputara n'ulo uku Babilon, nye ha n'aka otù onye, Sheshbaza bu aha-ya, onye o mere onye nāchi ala; 15 ọ si ya, Chiri ihe ndia, je, dọba ha n'ulo uku Chineke ahu nke di na Jerusalem, ka ewu kwa ulo Chineke n'ọnọdu-ya. 16 Mb͕e ahu Sheshbaza ahu biara, tọ ntọ-ala nile nke ulo Chineke nke di na Jerusalem: ma site na mb͕e ahu we rue ub͕u a ka anēwu ya, ma ewuzughi ya. 17 Ma ub͕u a, ọ buru na ọ di eze nma, ka achọ n'ulo àkù eze, nke di n'ebe ahu nime Babilon, ma ọ bu ezie na esitere n'aka Sairọs, bú eze, nye iwu iwu ulo a nke Chineke nime Jerusalem, ka eze zite-kwa-ra ayi ihe nātọ ya utọ bayere okwu a.

Ezra 6

1 Mb͕e ahu Daraiọs, bú eze, nyere iwu, ha we chọ n'ulo akwukwọ, ebe adọbara àkù nime Babilon. 2 Ewe chọta akwukwọ-npiakọta n'Ekbatar, n'ulo uku nke di n'ala anāchi achi, bú Midia, ma ihe-ncheta di nime ya nke edeworo otú a. 3 N'arọ mbu nke Sairọs, bú eze, Sairọs, bú eze, nyere iwu; Ulo Chineke nime Jerusalem, ka ewue ulo ahu, bú ebe ha nāchu àjà, ka atọ kwa ntọ-ala-ya si-ike; idi-elu-ya gādi ọgu cubit atọ, obosara-ya ọgu cubit atọ; 4 akuku atọ nke nkume nkpọrè, na otù ariri osisi ọhu: ka esi kwa n'ulo eze nye ego iji lu ọlu ahu: 5 ọzọ kwa, ka enyeghachi ihe ọla-edo na ọla-ọcha nke ulo Chineke, bú nke Nebukadneza chiputara n'ulo uku Chineke nke di na Jerusalem, chita na Babilon, ka achighachi kwa ha n'ulo uku Chineke nke di na Jerusalem, ihe ọ bula n'ọnọdu-ya, gi dọba kwa ha n'ulo Chineke. 6 Ub͕u a, Tatenai, bú onye nāchi ala n'ofè osimiri, na Sheta-bozenai, na ndi-òtù-ha, bú ndi-Afasakait, ndi nọ n'ofè osimiri, dinu n'ebe di anya site n'ebe ahu: 7 rapunu ọlu ulo a nke Chineke; kwe ka onye-isi ndi-Ju na ndi-okenye ndi-Ju wue ulo a nke Chineke n'ọnọdu-ya. 8 Anēsite kwa n'akam nye iwu bayere ihe unu gēme ndi-okenye ahu nke ndi-Ju iwu ulo a nke Chineke: ka eme ngwa si n'àkù eze, bú nke sitere n'utu anātu n'ofè osimiri, nye ndikom ahu ego iji lu ọlu ahu, ka ha ghara ikwusi. 9 Ihe di kwa ha nkpà, ma umu-oke-ehi, ma ebulu, ma umu-aturu, iji churu Chineke nke elu-igwe àjà-nsure-ọku, ma ọka wheat, ma nnú, ma manya-vine, ma manu, dika okwu-ọnu ndi-nchu-àjà si di, bú ndi nọ na Jerusalem, ka ewere ya nye ha kwa-ubọchi nēmehiegh: 10 ka ha we nēweta nso ihe ísì utọ nye Chineke nke elu-igwe, nēkpe kwa ekpere bayere ndu eze, na nke umu-ya ndikom. 11 Anēsite kwa n'akam nye iwu, na onye ọ bula nke gāb͕anwe okwu a, ka adọputa osisi n'ulo-ya, bulie onye ahu kpọgide ya n'elu ya; ka eme kwa ulo-ya ebe-ikpofu-ahihia n'ihi nka: 12 Chineke kwa Nke mere aha-Ya ka o biri n'ebe ahu, Ya tudà eze na ndi ọ bula nke gēseti aka-ya ib͕anwe okwu a, na ime ka ulo a nke Chineke nke di na Jerusalem la n'iyì. Mu onwem, bú Dariọs, enyewo iwu; ka ewere ngwa ngwa me ya. 13 Mb͕e ahu Tatenai, bú onye nāchi ala n'ofè osimiri, na Sheta-bozenai, na ndi-òtù-ha, dika ozi ahu si di nke Daraiọs, bú eze, ziri, otú a ka ha were ngwa ngwa me. 14 Ma ndi-okenye nke ndi-Ju nēwu ulo, ihe nāga-kwa-ra ha nke-ọma, site n'ibu-amuma nke Hagai, bú onye-amuma, na Zekaraia nwa Ido. Ha we wue, wuzu kwa ya, site n'ihe Chineke Israel nyere n'iwu, na site n'ihe Sairọs na Daraiọs na Ataksakses, bú eze Peasia, nyere n'iwu. 15 Ma n'ubọchi nke-atọ nke ọnwa Ada, nke di n'arọ nke-isi nke ọbubu-eze Daraiọs, bú eze, ka ewuchara ulo a. 16 Umu Israel, bú ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na ndi fọduru n'umu ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, were ọṅù me ememe nke irara ulo a nke Chineke nye Chineke. 17 Ha we weta nso n'irara ulo a nke Chineke nye Chineke ọgu oke-ehi ise, na ọgu ebulu iri, na nnù umu-aturu; na nkpi iri-na-abua, iji churu Israel nile àjà-nmehie, dika nguta nke ebo nile nke Israel si di. 18 Ha we guzo ndi-nchu-àjà nime nkewa-ha, na ndi Livai n'òkè-ha, bayere òfùfè Chineke, nke di na Jerusalem; dika edere ya n'akwukwọ Moses. 19 Umu ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ we me ememe ngabiga n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa mbu. 20 N'ihi na ndi-nchu-àjà na ndi Livai mere onwe-ha ka ha di ọcha n'otù; ha nile di ọcha: ha we b͕uere umu nile nke ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ anu ngabiga, b͕u-kwa-ra umu-nne-ha, bú ndi-nchu-àjà, b͕u-kwa-ra onwe-ha. 21 Umu Israel we rie, bú ndi nēsi n'etiti ndi emere ka ha je birl n'ala ọzọ lata, ha na onye ọ bula nke nēkewapu onwe-ya n'ọrurú nke mba nile nke ala ahu iso ha, ichọ Jehova, bú Chineke Israel, 22 ha we were ọṅù me ememe achicha ekoghi-eko ubọchi asa: n'ihi na Jehova mere ka ha ṅuria ọṅu, O me-kwa-ra ka obi eze Asiria chigharia n'ebe ha nọ, ime ka aka-ha di ike n'ije-ozi nke ulo Chineke, bú Chineke Israel.

Ezra 7

1 Ma mb͕e ihe ndia gasiri, n'ọbubu-eze nke Ataksakses, bú eze Peasia, Ezra nwa Seraia, nwa Azaraia, nwa Hilkaia, 2 nwa Shalum, nwa Zedok, nwa Ahaitub, 3 nwa Amaraia, nwa Azaraia, nwa Meraiot, 4 nwa Zerahia, nwa Uzi, nwa Buki, 5 nwa Abishua, nwa Finehas, nwa Eleeza, nwa Eron, bú onye-isi-nchu-àjà: 6 Ezra nka siri na Babilon rigo; ma onye ahu bu ode-akwukwọ nke bu onye-ọ̀kà n'iwu Moses, nke Jehova, bú Chineke Israel, nyere: eze we nye ya ihe nile ọ riọrọ, dika aka Jehova, bú Chineke-ya, si di n'aru ya. 7 Ufọdu nime umu Israel na nime ndi-nchu-àjà na ndi Livai na ndi-ọbù-abù na ndi-ọnu-uzọ-ama na Netinim we rigorue Jerusalem n'arọ nke-asa nke Ataksakses, bú eze. 8 O we biarue Jerusalem n'ọnwa nke-ise, nke ahu di n'arọ nke-asa nke eze. 9 N'ihi na n'ubọchi mbu nke ọnwa mbu, nke ahu bu ntọ-ala nke nrigo ahu site na Babilon, ma ọ bu n'ubọchi mbu nke ọnwa nke-ise ka ọ biaruru Jerusalem, dika ezi aka Chineke-ya si di n'aru ya. 10 N'ihi na Ezra doziri obi-ya ichọ iwu Jehova, na ime ya, na izí ukpuru-Ya na ikpé-Ya n'Israel. 11 Ma nka bu ndeputa akwukwọ-ozi ahu nke eze, bú Ataksakses, nyere Ezra, bú onye-nchu-aja, bú ode-akwukwọ, ọbuná ode-akwukwọ nke okwu nile nke ihe nile Jehova nyere n'iwu, na nke ukpuru-Ya nile O nyere Israel. 12 Ataksakses, bú eze nāchi ndi-eze, nēdegara Ezra akwukwọ, bú onye-nchu-àjà, bú ode-akwukwọ nke iwu Chineke nke elu-igwe, onye zuru okè, na ihe ọzọ di otú a. 13 Esitewo n'akam nye iwu, na onye ọ bula nke nwere afọ-ofufo ije Jerusalem nime ndi Israel, na ndi-nchu-àjà-ha na ndi Livai, n'ala-ezem, ya so gi je. 14 N'ihi na anēsi n'iru eze na madu asa ndi nādu ya ọdu ziga gi iwere iwu Chineke-gi nke di n'aka-gi ju ajuju bayere Juda, baye-kwa-ra Jerusalem; 15 na ibūru ọla-ọcha na ọla-edo nke eze na ndi nādu ya ọdu were afọ-ofufo nye Chineke Israel, Onye ebe-obibi-Ya di na Jerusalem, 16 na ọla-ọcha na ọla-edo nile nke i gāchọta n'ala ahu nile anāchi achi, bú Babilon, tiyere onyinye-afọ-ofufo nke ndi-gi, na nke ndi-nchu-àjà-ha, ndi nēwere afọ-ofufo nye onwe-ha bayere ulo Chineke-ha nke di na Jerusalem; 17 n'ihi nka i gēme ngwa were ego a zuru oke-ehi na ebulu na umu-aturu, na onyinye-inata-iru-ọma-ha na àjà-ihe-ọṅuṅu-ha, i gēweta ha nso ebe-ichu-àjà nke ulo Chineke-unu nke di na Jerusalem. 18 Ma ihe ọ bula nke gādi gi nma, di kwa umu-nne-gi nma, iwere nke fọduru nime ọla-ọcha na ọla-edo ahu me, dika ọchichọ Chineke-unu si di ka unu gēme. 19 Ihe nile kwa nke anēnye gi iji fè òfùfè nke ulo Chineke-gi, gi me ha ka ha zue okè n'iru Chineke Jerusalem. 20 Ma nke fọduru n'ihe nile di nkpà nke ulo Chineke-gi, nke gādabayere gi inye, si n'ulo àkù eze nye ya. 21 Anēsite kwa n'akam, bú mu onwem, Ataksakses, bú eze, nye ndi-odozi-àkù nile ndi nọ n'ofè osimiri iwu, na ihe ọ bula Ezra, bú onye-nchu-àjà, bú ode-akwukwọ nke iwu Chineke nke elu-igwe, gāriọ unu, ka eme ya ngwa ngwa, 22 rue ọgu talent ọla-ọcha ise, ru kwa ọgu cor ọka wheat ise, ru kwa ọgu bath manya-vine ise, ru kwa ọgu bath manu ise, na nnú nke anēdeghi akwukwọ ọtùtù-ya. 23 Ihe ọ bula nke putara n'iwu Chineke nke elu-igwe, ka eme ya n'uzọ ziri ezi nye ulo Chineke nke elu-igwe; n'ihi na, n'ìhi gini ka iwe gādi megide ala-eze nke eze na umu-ya ndikom? 24 Ayi nēme kwa ka unu mara, na ọ dighi onye ka enyere ike n'aru ndi-nchu-àjà na ndi Livai ọ bula, ma-ọbu ndi nābù abù ọma, ma-ọbu ndi-ọnu-uzọ-ama, ma-ọbu Netinim, ma-ọbu ndi nēfè òfùfè nke ulo a nke Chineke, inara ha utu-ala, ma-ọbu utu-ahia, ma-ọbu utu-uzọ. 25 Ma gi onwe-gi, Ezra, dika amam-ihe nke Chineke-gi nke di n'aka-gi si di, guputa ndi-ikpe na ndi-odozi-okwu, ndi gāburu ndi nile nọ n'ofè osimiri, bú ndi nile mara iwu Chineke-gi, ndi-odozi-okwu; me-kwa-nu ka ọ mara iwu ahu, bú onye nāmaghi. 26 Ma onye nke nēmeghi iwu Chineke-gi, na iwu eze, ka ewere ngwa ngwa me ya ihe ekpere n'ikpe, ma ọ bu inwu ọnwu, ma-ọbu iwepu ya n'ala, ma-ọbu iri àkù-ya na nra, ma-ọbu ike ya ab͕u. 27 Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke nke nna-ayi-hà, bu, Onye tiyeworo ihe di otú a n'obi eze, nime ka ulo Jehova nke di na Jerusalem ma nma; 28 Onye setiwo-kwa-ra ebere-Ya n'ebe m'nọ n'iru eze na ndi nādu ya ọdu, na n'iru ndi-isi nile nke eze bu ndi-dike. M'we me onwem ka m'di ike dika aka Jehova, bú Chinekem, si di n'arum, m'we chikọputa n'Israel ndi-isi isorom rigo.

Ezra 8

1 Ma ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha, nka bu kwa akwukwọ-osuso-ọmumu nke ndi nēsom si na Babilon rigo, n'ọbubu-eze Ataksakses, bú eze. 2 Site n'umu Finehas, Giashom: site n'umu Itama, Daniel: site n'umu Devid, Hatush. 3 Site n'umu Shekania; site n'umu Parosh, Zekaraia: ndi soro ya, bú ndi edere n'akwukwọ-osuso-ọmumu diri ndikom, di ọgu asa na iri. 4 Site n'umu Pahat-moab, Eliehoenai nwa Zerahai; ndi soro ya di ọgu ndikom iri. 5 Site n'umu Shekania, nwa Jahaziel; ndi soro ya di ọgu ndikom iri-na-ise. 6 Site kwa n'umu Adin, Ebed nwa Jonatan; ndi soro ya di ọgu ndikom abua na iri. 7 Site kwa n'umu Ilam, Jeshaia nwa Atalaia; ndi soro ya di ọgu ndikom atọ na iri. 8 Site kwa n'umu Shefataia, Zebadaia nwa Maikael; ndi soro ya di ọgu ndikom anọ. 9 Site n'umu Joab, Obadaia nwa Jehiel; ndi soro ya di ọgu ndikom iri na iri na asatọ. 10 Site kwa n'umu Shelomit, nwa Josifia; ndi soro ya di ọgu ndikom asatọ. 11 Site kwa n'umu Bebai, Zekaraia nwa Bebai; ndi soro ya di orú ndikom na asatọ. 12 Site kwa n'umu Azgad, Johanan nwa Hakatan; ndi soro ya di ọgu ndikom ise na iri. 13 Site kwa n'umu Adonikam, bú ndi-ikpe-azu; ndia bu kwa aha-ha, Elifelet, na Jeuel, na Shemaia; ndi soro ha di ọgu ndikom atọ. 14 Site kwa n'umu Bigvai, Utai na Zabud; ndi soro ha di ọgu ndikom atọ na iri. 15 M'we chikọta ha rue osimiri nke nērùbata n'Ahava; ayi we nọ n'ọmuma-ulo-ikwū n'ebe ahu ubọchi atọ: m'we mata ndi ahu, mata kwa ndi-nchu-àjà, ma ọ dighi onye nime umu Livai m'chọtara n'ebe ahu. 16 M'we zìe kpọ Elieza, kpọ kwa Ariel, kpọ kwa Shemaia, kpọ kwa Elnetan, kpọ kwa Jarib, kpọ kwa Elnetan, kpọ kwa Netan, kpọ kwa Zekaraia, kpọ kwa Meshulam, bú ndi-isi; m'kpọ kwa Joiarib, kpọ kwa Elnetan, bú ndi-nghọta. 17 M'we nye ha iwu inye Ido, bú onye-isi na Kasifia, bú ebe ahu; m'we tiye n'ọnu-ha okwu igwa Ido, bú nwa-nne-ya, na Netinim, nime Kasifia, bú ebe ahu, ka ha me ka ndi nējere ulo Chineke-ayi ozi biakute ayi. 18 Ha we me ka otù nwoke nke nwere uche biakute ayi, dika ezi aka nke Chineke-ayi si di n'aru ayi, o sitere n'umu Mahli, nwa Livai, nwa Israel; na Sherebia na umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri-na-asatọ; 19 na Hashabaia, ya na Jeshaia nke sitere n'umu Merari, na umu-nne-ya na umu-ha ndikom, orú madu; 20 site kwa na Netinim, ndi Devid na ndi-isi nyere ka ha fè òfùfè nke ndi Livai, ọgu Netinim iri-na-otù: ha nile ka akpọrọ n'aha n'aha. 21 M'we kpọsa obubu-ọnu n'ebe ahu, n'akuku osimiri Ahava, iweda onwe-ayi n'ala n'iru Chineke-ayi ichọta n'aka-Ya uzọ ziri ezi nye onwe-ayi, nye kwa umu-ntakiri-ayi, nye kwa àkù-ayi nile. 22 N'ihi na emerem ihere iriọ n'aka eze usu-ndi-agha na ndi-inyinya iyere ayi aka n'ihi onye-iro nke di n'uzọ: n'ihi na ayi gwara eze okwu, si, Aka Chineke-ayi di n'aru ndi nile nāchọ Ya, ime ha nma; ma ike-Ya na iwe-Ya nēmegide ndi nile nārapu Ya. 23 Ayi we bue ọnu, riọ Chineke-ayi aririọ bayere nka: O we kwe ka ayi riọta ihe ayi riọrọ. 24 M'we kewaputa na ndi-isi nke ndi-nchu-àjà madu iri na abua, bú Sherebia na Hashabaia, ha na madu iri ndi sitere n'umu-nne-ha, 25 m'we tùara ha ọla-ọcha ahu, na ọla-edo ahu, na ihe ahu nile, bú àjà-nbuli nke ulo Chineke-ayi, nke eze, na ndi nādu ya ọdu, na ndi-isi-ya, na Israel nile ahuru n'ebe ahu, buliri: 26 m'we tùa nye ha n'aka nnù talent ọla-ọcha na ọgu iri-na-abua na iri, na ọgu talent ihe ọla-ọcha ise; na ọgu talent ọla-edo ise; 27 na orú ọkwa ntà ọla-edo, ọtùtù-ha bu nnù daric abua na ọgu iri; na ihe abua nke ezi ọla nācha edo edo, bú ihe anāchọsi ike dika ọla-edo. 28 M'we si ha, Unu onwe-unu bu ihe nsọ Jehova nwere, ihe ndia bu kwa ihe nsọ; ọla-ọcha na ọla-edo bu kwa onyinye-afọ-ofufo enyere Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà. 29 Nechenu ha nche, debe kwa ha, rue mb͕e unu tùru ha n'iru ndi-isi nke ndi-nchu-àjà na ndi Livai, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke Israel, nime Jerusalem, n'ime-ulo nke ulo Jehova. 30 Ndi-nchu-àjà na ndi Livai we nara ọtùtù nke ọla-ọcha na ọla-edo na ihe ahu nile, ibūru ha biarue Jerusalem rue ulo Chineke-ayi. 31 Ayi we si n'osimiri Ahava n'ubọchi nke-iri-na-abua nke ọnwa mbu bulie ije, ijeru Jerusalem: aka Chineke-ayi we di n'aru ayi, O we naputa ayi n'aka onye-iro ọ bula na onye nēche anwu n'uzọ. 32 Ayi we biarue Jerusalem, nọdu n'ebe ahu ubọchi atọ. 33 Ma n'ubọchi nke-anọ ka atùru ọla-ọcha na ọla-edo na ihe ahu nile n'ulo Chineke-ayi nye n'aka Meremot, nwa Uraia, bú onye-nchu-àjà; Eleeza nwa Finehas nọye-kwa-ra ya; Jozabad nwa Jeshua na Noadaia nwa Binui, bú ndi Livai, nọye-kwa-ra ha; 34 n'ọnu-ọgugu na n'ọtùtù ka enyere ha ihe ọ bula: ewe de ọtùtù nile n'akwukwọ na mb͕e ahu. 35 Ndi nēsi na ndọta-n'agha bia, bú umu ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, wetara àjà-nsure-ọku nso Chineke Israel, oke-ehi iri na abua n'ihi Israel nile ọgu ebulu anọ na iri na isi, ọgu umu-aturu atọ na iri na asa, nkpi iri na abua ibu àjà-nmehie: ihe a nile bu àjà-nsure-ọku isurere Jehova. 36 Ha we nye ndi nọchiri anya eze na ndi nāchi ala n'ofè osimiri iwu nile nke eze: ha we yere ndi-Ju na ulo Chineke aka.

Ezra 9

1 Ma mb͕e emere ka ihe ndia gwusia, ndi-isi biarurum nso, si, Ndi Israel, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, ha ekewapughi onwe-ha n'etiti ndi di iche iche nke ala ọzọ, nēme dika ihe-árú-ha si di, bú ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi Jebus, na ndi Amon, na ndi Moab, na ndi Ijipt, na ndi-Amorait. 2 N'ihi na ha esiwo n'umu-ha ndinyom lutara onwe-ha nwunye, luta-kwa-ra umu-ha ndikom; nkpuru nsọ ahu we gwakọta onwe-ha na ndi di iche iche nke ala ọzọ: ma aka ndi-isi na ndi nāchi ala bu uzọ na nmekpu a. 3 Ma mb͕e m'nuru okwu a, adọwaram uwem na uwe-nwudam, ropu kwa ufọdu n'agiri-isi nke isim na aji afu-ọnum, m'we nọdu, ibobo we nwuam n'aru. 4 Ewe chikọta n'ebe m'nọ onye ọ bula nke nāma jijiji n'okwu Chineke Israel, n'ihi nmekpu nke ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ; ma mu onwem nānọdu, ibobo we nwuam n'aru, rue mb͕e onyinye-inata-iru-ọma nke anyasi. 5 Ma na mb͕e onyinye-inata-iru-ọma nke anyasi, esirim n'iweda onwem n'ala bilie, ọbuná na ndọwa na uwe-nwudam; m'we ruru ala n'ikperèm b͕asara Jehova, bú Chinekem, ọbu-akam abua; 6 M'we si, Chinekem, ihere nēmem, irum nwughari-kwa-ra n'ihi ihere, iweliri Gi irum elu, Chinekem: n'ihi na ajọ omume-ayi bara uba kari isi-ayi elu, ikpe-ọmuma-ayi aghọwo kwa ihe uku rue elu-igwe. 7 Site n'ubọchi nna-ayi-hà ayi onwe-ayi anọwo n'ikpe-ọmuma uku rue ta; ma n'ihi ajọ omume nile ayi ka enyere ayi onwe-ayi, na ndi-eze-ayi, na ndi-nchu-àjà-ayi, n'aka ndi-eze ala ọzọ, na mma-agha, na na ndọta-n'agha, na nime nluta-n'agha, na n'ihere iru, dika o si di ta. 8 Ma ub͕u a na mb͕e dika nwa ntabi-anya amara esitewo n'aka Jehova, bú Chineke-ayi, ime ka ndi b͕apuru ab͕apu fọduru ayi, na inye ayi otù ǹtú n'ebe nsọ Ya, ka Chineke-ayi we nye anya-ayi ìhè, na idebere ayi nwantī ndu n'ọbubu-orù-ayi. 9 N'ihi na ndi-orù ka ayi bu; ma Chineke-ayi arapughi ayi n'ọbubu-orù-ayi, kama O setiwo ebere rue ayi aru n'iru ndi-eze Peasia, idebere ayi ndu, iwuli ulo Chineke-ayi elu, na ime ka nkpọnkpọ-ebe-ya nile guzo, na inye ayi mb͕idi nime Juda na nime Jerusalem. 10 Ma ub͕u a, Chineke-ayi, àyi gāsi gini mb͕e ihe a gasiri? n'ihi na ayi arapuwo ihe nile I nyere n'iwu, 11 nke I nyere n'iwu site n'aka ndi-orù-Gi, bú ndi-amuma, si, Ala ahu nke unu onwe-unu nābata inweta ya, ala isọ-nsọ ka ọ bu n'isọ-nsọ nke ndi di iche iche nke ala ọzọ, site n'ihe-árú nile ha, nke juputaworo ya site n'otu ọnu-uzọ rue ọnu-uzọ ọzọ, n'ọrurú-ha. 12 Ma ub͕u a unu enyela umu-ha ndikom umu-unu ndinyom, unu ekuru-kwa-la umu-ha ndinyom nye umu-unu ndikom, unu achọ-kwa-la udo-ha ma-ọbu ọdi-nma-ha rue mb͕e ebighi-ebi: ka unu we di ike, rie ezi ihe nke ala ahu, me kwa ka umu-unu nweta ya rue mb͕e ebighi-ebi. 13 Ma mb͕e ihe nile a gasiri, nke nābiakwasi ayi n'ihi omume ọjọ nile ayi, na n'ihi ikpe-ọmuma uku ayi, n'ihi na Gi onwe-gi, bú Chineke-ayi, eb͕ochiwo ahuhu-nmehie-ayi, ka ọ ghara idi elu ka ajọ omume-ayi, I we nye ndi-nb͕apu di otú a, 14 àyi gālaghachi kwa mebie ihe nile I nyere n'iwu, we ghọ ọgọ ndi ahu ndi nēme ihe-árú ndia? Ì gaghi-ewesa ayi iwe, rue mb͕e emere ka ayi gwusi, ndi fọduru ma-ọbu ndi-nb͕apu we ghara idi? 15 Jehova, bú Chineke Israel, onye ezi omume ka I bu; n'ihi na ayi fọduru ibu ndi-nb͕apu, dika o si di ta: le, ayi nọ n'iru Gi n'ikpe-ọmuma-ayi; n'ihi na ọ dighi onye iguzo n'iru Gi n'ihi nka.

Ezra 10

1 Ma mb͕e Ezra nēkpe ekpere, nēkwuputa kwa ekwuputa, nākwa ákwá nātuda kwa onwe-ya n'ala n'iru ulo Chineke, esiri n'Israel chikọta n'ebe ọ nọ nkpọkọta madu di ọtutu nke-uku, bú ndikom, na ndinyom, na umu-ntakiri: n'ihi na ndi Israel kwara ákwá ri nne. 2 Shekania nwa Jehiel, nke sitere n'umu Ilam, we za, si Ezra, Ayi onwe-ayi emekpuwo emekpu megide Chineke-ayi, luta ndinyom ala ọzọ sitere na ndi di iche iche nke ala nka: ma ub͕u a Israel nwere olile-anya bayere ihe a. 3 Ma ub͕u a ka ayi na Chineke-ayi b͕a ndu na ayi gēme ka ndinyom ahu nile na umu amuru site na ha pua, dika ndumọdu si di nke Onye-nwe-ayi, na nke ndi nāma jijiji n'ihe nile nke Chineke-ayi nyere n'iwu; dika iwu-Ya si di ka agēme kwa ya. 4 Bilie; n'ihi na okwu a diri gi, ayi onwe-ayi nọye-kwa-ra gi: di ike, me kwa ya. 5 Ezra we bilie, me ndi-isi nke ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na Israel nile, ka ha ṅua iyi ime dika okwu a si di. Ha we ṅua iyi. 6 Ezra we si n'iru ulo Chineke bilie, jerue ime-ulo Jehohanan nwa Elaiashib: o we je n'ebe ahu, ma o righi nri, ọ ṅughi kwa miri: n'ihi na o nēru újú n'ihi nmekpu nke ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ. 7 Ha we kwusa nime Juda na Jerusalem gwa umu nile nke ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ka ha chikọta onwe-ha na Jerusalem; 8 ka ewezuga kwa àkù-ya nile ibibi ya, kewapu kwa onye ahu na nkpọkọta ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, bú onye ọ bula nke nābiaghi n'ubọchi atọ, dika ndum-ọdu ndi-isi na ndi-okenye si di. 9 Ndikom nile nke Juda na Benjamin we chikọta onwe-ha na Jerusalem n'ubọchi atọ; nke ahu bu ọnwa nke-iteghete, n'ubọchi nke-orú n'ọnwa ahu: ndi ahu nile we nọdu n'amá ulo Chineke, nāma jijiji n'ihi okwu a, na site n'oké miri-ozuzo nile. 10 Ezra, bú onye-nchu-àjà, we bilie, si ha, Unu onwe-unu emekpuwo emekpu, luta ndinyom ala ọzọ, itukwasi ihe n'ikpe-ọmuma Israel. 11 Ma ub͕u a nyenu Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, ekele, me kwa ihe nātọ Ya utọ: kewaputa-kwa-nu onwe-unu n'aru ndi di iche iche nke ala nka, na n'aru ndinyom ala ọzọ. 12 Nkpọkọta ahu nile we were oké olu za, si, O ziri ezi, dika okwu-gi nile n'ebe ayi nọ si di, ayi aghaghi ime otú a. 13 Ma ndi Israel di ọtutu, ọ bu kwa mb͕e oké miri-ozuzo, ike adighi kwa ayi iguzo n'èzí, ma ozi a abughi nke otù ubọchi, ọ bughi kwa nke ubọchi abua: n'ihi na ayi ejehiewo ri nne n'okwu a. 14 Biko, ka ndi-isi-ayi guzoro nkpọkọta nka nile, ka ndi nile ndi nọ n'obodo nile ayi bia kwa na mb͕e ezubere, bú ndi lutara ndinyom ala ọzọ, ha na ndi-okenye obodo nile ọ bula, na ndi-ikpe-ya, rue mb͕e iwe ọku nke Chineke-ayi bayere okwu a si n'aru ayi laghachi. 15 Otú ọ di, Jonatan nwa Asahel na Jahzeia nwa Tikva guzoro imegide ihe a: Meshulam na Shabetai, bú onye Livai, yekwara ha aka. 16 Umu nke ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ we me otú a. Ewe kewapu Ezra, bú onye-nchu-àjà, na ndikom ọzọ, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, ha nile n'aha-ha kwa; ha we nọdu n'ubọchi mbu nke ọnwa nke-iri ka ha we jua ajuju okwu a. 17 Ha we jubìe ajuju n'okwu ndikom nile ndi lutaworo ndinyom ala ọzọ n'ubọchi mbu nke ọnwa mbu. 18 Ewe chọta ufọdu n'etiti umu ndi-nchu-àjà ndi lutaworo ndinyom ala ọzọ: bú, n'etiti umu Jeshua, nwa Jozadak, na umu-nne-ya: Maaseia, na Elieza, na Jarib, na Gedalaia. 19 Ha we nye aka-ha ime ka ndinyom-ha pua; ebe ikpe mara ha, ha we nye ebulu nke ìgwè aturu n'ihi ikpe-ọmuma-ha. 20 Na n'etiti umu Imea; Hanani na Zebadaia. 21 Na n'etiti umu Harim; Maaseia, na Elaija, na Shemaia, na Jehiel, na Uzaia. 22 Na n'etiti umu Pashua; Elioenai, na Maaseia, na Ishmael, na Netanel, na Jozabad, na Elasa. 23 Na n'etiti ndi Livai; Jozabad, na Shimai, na Kelaia, (onye ahu bu Kelita), na Petahia, na Juda, na Elieza. 24 Na n'etiti ndi-ọbù-abù; Elaiashib: na n'etiti ndi-ọnu-uzọ-ama; Shalum, na Telem, na Uri. 25 Na n'etiti Israel: n'etiti umu Parosh; Ramia, na Izia, na Malkija, na Mijamin, na Eleeza, na Malkija, na Benaia. 26 Na n'etiti umu Ilam; Matanaia, na Zekaraia, na Jehiel, na Abdi, na Jeremot, na Elaija. 27 Na n'etiti umu Zatu; Elioenai, na Elaiashib, na Matanaia, na Jeremot, na Zabad, na Aziza. 28 Na n'etiti umu Bebai; Jehohanan, na Hananaia, na Zabai, na Atlai. 29 Na n'etiti umu Bani; Meshulam, na Maluk, na Adaia, na Jashub, na Sheal, na Jeremot. 30 Na n'etiti umu Pahat-moab; Adna, na Kelal, na Benaia, na Maaseia, na Matanaia, na Bezalel, na Binui, na Manase. 31 Na n'etiti umu Harim; Elieza, na Ishija, na Malkija, na Shemaia, na Shimeon; 32 Benjamin, na Maluk, na Shemaria; 33 Na n'etiti umu Hashum; Matenai, na Matata, na Zabad, na Elifelet, na Jeremai, na Manase, na Shimai. 34 Na n'etiti umu Bani; Maadai, na Amram, na Uel; 35 na Benaia, na Bedeia, na Keluhi; 36 na Vania, na Meremot, na Elaiashib; 37 na Matanaia, na Matenai, na Jaasu; 38 na Bani, na Binui, na Shimai; 39 na Shelemaia, na Netan, na Adaia; 40 na Maknadebai, na Shashai, na Sharai; 41 na Azarel, na Shelemaia, na Shemaria; 42 na Shalum, na Amaraia, na Josef. 43 N'etiti umu Nebo; Jeiel, na Matitaia, na Zabad, na Zebina, na Ido, na Joel, na Benaia. 44 Ndia nile alutawo ndinyom ala ọzọ na nwunye: ufọdu nime ha nwe-kwa-ra ndinyom ndi ha siri n'aka ha mu umu-ndikom.

Nehemaia 1

1 Okwu Nehemaia nwa Hakalaia. O rue, n'ọnwa Kislev, n'arọ nke-orú, na mu onwem nọ na Shushan, bú ulo uku eze. 2 Hanani, bú otù nime umu-nnem, we bia, ya onwe-ya na ndikom ufọdu ndi sitere na Juda; m'we jua ha ajuju bayere ndi-Ju, bú ndi-nb͕apu, nke fọduru site na ndọta-n'agha, na ajuju bayere Jerusalem. 3 Ha we sim, Ndi fọduru, bú ndi fọduru site na ndọta-n'agha n'ebe ahu n'ala ahu anāchi achi nọ n'ọnọdu ọjọ na n'ita-uta: etipúsi-kwa-ra mb͕idi Jerusalem, sure kwa ọnu-uzọ-ama-ya nile ọku. 4 O rue, mb͕e m'nuru okwu ndia, na anọdurum ala, kwa ákwá, rue újú ubọchi ufọdu; m'we bue ọnu, kpe kwa ekpere n'iru Chineke nke elu-igwe, 5 si, Biko, Jehova, bú Chineke nke elu-igwe, Chineke uku, Nke di kwa egwu, Onye nēdebere ndi nāhu Ya n'anya nēdebe kwa ihe nile O nyere n'iwu, ọb͕ub͕a-ndu-Ya na ebere: 6 biko, ka nti-Gi nāṅa nti, ka anya-Gi abua saghe kwa, ka I we ge nti ekpere orù-Gi, nke mu onwem nēkpe n'iru Gi ta, ehihie na abali, bayere umu Israel, bú ndi-orù-Gi, m'nēkwuputa kwa nmehie nile nke umu Israel, nke ayi mehieworo megide Gi: e, mu onwem na ulo nnam emehiewo. 7 Ayi emejọwo Gi nke-uku, ayi edebeghi kwa ihe nile enyere n'iwu, na ukpuru nile, na ikpé nile, nke I nyere Moses, bú orù-gi, n'iwu. 8 Biko, cheta okwu ahu nke I nyere Moses, bú orù-Gi, n'iwu, si, Asi na unu onwe-unu emekpu emekpu, Mu onwem gēme ka unu b͕asa n'etiti ndi nile: 9 ma asi na unu alaghachikutem, we debe ihe nile M'nyere n'iwu me kwa ha, ọ buru na ndi-unu anāchufu adi na nsọtu elu-igwe, site n'ebe ahu ka M'gāchikọta ha, me ka ha biarue ebe ahu nke M'rọputaworo ime ka aham biri n'ebe ahu. 10 Ma ndia bu orù-Gi na ndi-Gi, ndi I were ike uku Gi, were kwa aka-Gi di ike, b͕aputa. 11 Biko, Onye-nwe-ayi, biko, ka nti-Gi nāṅa nti n'ekpere orù-Gi, na n'ekpere ndi-orù-Gi, ndi ọ nātọ utọ itu egwu aha-Gi: biko, me kwa ka ihe nāgara orù-Gi nke-ọma ta, me ka enwe obi-ebere n'aru ya n'iru nwoke a. (Ma mu onwem buru eze obu-ihe-ọṅuṅu. )

Nehemaia 2

1 O rue n'ọnwa Nisan, n'arọ nke-orú nke Ataksakses, bú eze, na manya-vine di n'iru ya, m'we buru manya-vine ahu, nye eze. Ma akaghm-ajọ njọ n'obi n'iru ya. 2 Eze we sim, Gini mere iru-gi jọrọ njọ, ma gi onwe-gi adighi-aria ọria? nka abughi ihe ọzọ, ọ bu nání obi jọrọ njọ. M'we tua egwu ri nne nke-uku. 3 M'we si eze, Ka eze di ndu rue mb͕e ebighi-ebi: gini mere irum agaghi-eji jọ njọ, mb͕e obodo ahu, bú ulo nke ílì nnam-hà, bu nkpọnkpọ ebe, eripiawo kwa ọnu-uzọ-ama-ya nile n'ọku? 4 Eze we sim, Ọ̀ bu gini kwa ka gi onwe-gi nāchọ? M'we kpere Chineke nke elu-igwe. 5 M'we si eze, Ọ buru na ọ di eze nma, ọ buru kwa na orù-gi di nma n'anya-gi, ọ bu ka i zigam na Juda, rue obodo ílì nnam-hà, ka m'we wue ya. 6 Eze we sim, (nwunye eze nānọdu kwa n'akuku ya, ) Rùe ole mb͕e ka ije-gi gādi? òle mb͕e ka i gālaghachi kwa? O we di nma n'anya eze, o we zigam; m'we nye ya oge. 7 M'we si eze, Ọ buru na ọ di eze nma, ka enyem akwukwọ-ozi inye ndi nāchi ala n'ofè osimiri, ka ha kwe ka m'gabiga rue mb͕e m'batara Juda; 8 na akwukwọ-ozi inye Esaf, bú onye nēche ogige ọma nke eze nwere, ka ọ nyem osisi ijikọta ọnu-uzọ-ama nile nke ulo uku ahu n'otù nke diri ulo ahu, na ijikọta mb͕idi obodo n'otù, na ijikọta ulo n'otù, bú nke m'gābà nime ya. Eze we nyem, dika ezi aka Chinekem si di n'arum. 9 M'we biakute ndi nāchi ala n'ofè osimiri, m'we nye ha akwukwọ-ozi eze. Ma eze zìri ndi-isi usu-ndi-agha na ndi-inyinya isom je. 10 Sanbalat, bú onye Horonaim, na Tobaia, bú orù, bú onye Amon, we nu ya, o we di ha njọ nke-uku na madu abiawo ichọrọ umu Israel ọdi-nma. 11 M'we bata Jerusalem, nọ n'ebe ahu ubọchi atọ. 12 M'we bilie n'abali, mu onwem na ndikom ole-na-ole sorom; ma egosighm madu ọ bula ihe Chinekem nētiye n'obim imere Jerusalem: ọ dighi kwa anu-ulo di n'ebe m'nọ, ọ bu nání anu-ulo ahu nke m'nānọkwasi ya. 13 M'we si n'ọnu-uzọ-ama ndagwurugwu pua n'abali, we rue n'iru isi-iyi dragon, ru kwa ọnu-uzọ-ama ebe ikpofu ahihia, we le mb͕idi Jerusalem nile anya, bú nke etipúsiri etipú, ọku eripiawo kwa ọnu-uzọ-ama-ya nile. 14 M'we gabiga rue ọnu-uzọ-ama isi-iyi, ru kwa ọdọ-miri eze: ọ dighi kwa ebe anu-ulo nke di n'okpurum gāgabiga. 15 M'we nārigo na miri-iyi n'abali, m'we nēle mb͕idi ahu anya; m'we chigharia, ba n'ọnu-uzọ-ama ndagwurugwu, we laghachi. 16 Ma ndi nọchiri anya eze amaghi ebe m'jere, ma-ọbu ihe mu onwem nēme; egosighkwam ndi-Ju rue ub͕u a, egosighkwam ndi-nchu-àjà, egosighkwam ndi amara aha-ha, egosighkwam ndi nọchiri anya eze, egosighkwam ndi fọduru ndi nēje ozi ahu. 17 M'we si ha, Unu onwe-unu nāhu ọnọdu ọjọ nke ayi onwe-ayi nọ nime ya, na Jerusalem bu nkpọnkpọ ebe, na esure-kwa-ra ọnu-uzọ-ama-ya nile n'ọku: bianu ka ayi wue mb͕idi Jerusalem, ka ayi we ghara ibu kwa ihe-ita-uta ọzọ. 18 M'we gosi ha aka Chineke nke di nma n'arum; na okwu nile nke eze kwa nke ọ gwaram. Ha we si, Ka ayi bilie lua mb͕idi. Ha we me ka aka-ha di ike ime ezi ihe a. 19 Sanbalat, bú onye Horonaim, na Tobaia, bú orù, bú onye Amon, na Geshem, bú onye Arebia, we nu ya, ha we chìa ayi ọchì, leda ayi anya, si, Gini bu ihe a nke unu onwe-unu nēme? ọ̀ bu eze ka unu nānupu isi imegide? 20 M'we zaghachi ha okwu, si ha, Chineke nke elu-igwe, Ya onwe-ya gēme ka ihe gara ayi nke-ọma; ayi onwe-ayi, bú ndi-orù-Ya, gēbili kwa lua mb͕idi: ma unu enweghi òkè, ma-ọbu ọnọdu ziri ezi, ma-ọbu ihe-ncheta, nime Jerusalem.

Nehemaia 3

1 Elaiashib, bú onye-isi-nchu-àjà, we bilie, ya na umu-nne-ya, bú ndi-nchu-àjà, ha we lua ọnu-uzọ-ama aturu; ha onwe-ha doro ya nsọ, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya; ọbuná rue ulo-elu Hamea ka ha doro ya nsọ, rue ulo-elu Hananel. 2 N'akuku ya ka ndikom Jeriko luru. N'akuku ha ka Zakua nwa Imri luru. 3 Ọnu-uzọ-ama azù ka umu Hasenaa luru; ndi ahu jikọtara ya n'otù, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya, na ihe-nkpachi-ya nile, na nkpọrọ-ya nile. 4 N'akuku ha ka Meremot nwa Uraia, nwa Hakoz, mere ka mb͕idi di ike. N'akuku ha ka Meshulam nwa Berekaia, nwa Meshezabel, mere ka mb͕idi di ike. N'akuku ha ka Zedok nwa Beana mere ka mb͕idi di ike. 5 N'akuku ha ka ndi Tekoa mere ka mb͕idi di ike; ma ndi-ha ndi di ebube etiyeghi olu-ha n'òfùfè Onye-nwe-ha. 6 Ọnu-uzọ-ama ochie ka Joiada nwa Pasea na Meshulam nwa Besodeia mere ka ọ di ike; ndi ahu jikọtara ya n'otù, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya, na ihe-nkpachi-ya nile, na nkpọrọ-ya nile. 7 N'akuku ha ka Melataia, bú onye Gibeon, na Jadon, bú onye Meronot, ndikom Gibeon na Mizpa, mere ka mb͕idi di ike rue oche-eze nke onye nāchi ala n'ofè osimiri. 8 N'akuku ya ka Uziel nwa Hahaia, bú ndi-nnucha-ọla, mere ka mb͕idi di ike. N'akuku ya ka Hananaia, bú otù onye nime ndi nāsugwa manu-otite nēsì ísì utọ, mere ka mb͕idi di ike, ha we rapu Jerusalem rue mb͕idi di obosara. 9 N'akuku ha ka Refaia nwa Hua, bú onye-isi nkera ala di Jerusalem buruburu, mere ka mb͕idi di ike. 10 N'akuku ha ka Jedaia nwa Harumaf mere ka mb͕idi di ike, bú na ncherita-iru ulo-ya. N'akuku ya ka Hatush nwa Hashabneia mere ka mb͕idi di ike. 11 Malkija nwa Harim na Hashub nwa Pahat-moab mere ka iberibe ọzọ atùru atù di ike, bú ulo-elu nke ite-ọku uku. 12 N'akuku ya ka Shalum nwa Halohesh, bú onye-isi nkera ala di Jerusalem buruburu, mere ka mb͕idi di ike, ya onwe-ya na umu-ya ndinyom. 13 Ọnu-uzọ-ama ndagwurugwu ka Hanun na ndi bi na Zanoa mere ka ọ di ike; ndi ahu luru ya, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya, na ihe-nkpachi-ya nile, na nkpọrọ-ya nile, na nnù cubit mb͕idi abua na ọgu iri rue ọnu-uzọ-ama ebe ikpofu ahihia. 14 Ọnu-uzọ-ama ebe ikpofu ahihia ka Malkija nwa Rikab, bú onye-isi ala di Bet-hakerem buruburu, mere ka ọ di ike; onye ahu luru ya, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya, na ihe-nkpachi-ya nile, na nkpọrọ-ya nile. 15 Ọnu-uzọ-ama isi-iyi ka Shalun nwa Kọl-hoze, bú onye-isi ala di Mizpa buruburu, mere ka ọ di ike; onye ahu luru ya, kpue ya, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya, na ihe-nkpachi-ya nile, na nkpọrọ-ya nile, na mb͕idi ọdọ-miri Shela, rue ubi eze ab͕ara ogige, ru kwa ihe-nrigo nke nēsi n'obodo Devid rida. 16 N'iso ya ka Nehemaia nwa Azbuk, bú onye-isi nkera ala di Bet-zua buruburu, mere ka mb͕idi di ike, rue na ncherita-iru ílì Devid, ru kwa ọdọ-miri nke emere, ru kwa ulo ndi-dike. 17 N'iso ya ka ndi Livai, Rehum nwa Bani, mere ka mb͕idi di ike. N'akuku ya ka Hashabaia, bú onye-isi nkera ala di Keila buruburu, mere ka mb͕idi diri buruburu-ala-ya ike. 18 N'iso ya ka umu-nne-ha, na Bavai nwa Henadad, bú onye-isi nkera ala di Keila buruburu, mere ka mb͕idi di ike. 19 N'akuku ya ka Eza nwa Jeshua, bú onye-isi Mizpa, mere ka iberibe ọzọ atùru atù di ike, site na ncherita-iru nrigo ulo-ihe-ekike-agha na nkuku mb͕idi. 20 N'iso ya ka Beruk nwa Zabai nuru ọku n'obi ime iberibe ọzọ atùru atù di ike, site na nkuku mb͕idi rue ọnu-uzọ ulo Elaiashib, bú onye-isi-nchu-àjà. 21 N'iso ya ka Meremot nwa Uraia nwa Hakoz mere ka iberibe ọzọ atùru atù di ike, site n'ọnu-uzọ ulo Elaiashib we rue nsọtu ulo Elaiashib. 22 N'iso ya ka ndi-nchu-àjà, bú ndikom nke Buruburu-ala, mere ka mb͕idi di ike. 23 N'iso ha ka Benjamin na Hashub mere ka mb͕idi di ike na ncherita-iru ulo-ha. N'iso ha ka Azaraia nwa Maaseia nwa Ananaia mere ka mb͕idi di ike n'akuku ulo-ya. 24 N'iso ya ka Binui nwa Henadad mere ka iberibe ọzọ atùru atù di ike, site n'ulo Azaraia rue nkuku mb͕idi, ọbuná rue ulo-elu nkuku. 25 Palal nwa Uzai mere ka mb͕idi di ike site na ncherita-iru nkuku mb͕idi, na ulo-elu nke nāputa n'ulo di n'elu nke eze, bú nke di nso ogige ulo-nche. N'iso ya ka Pedaia nwa Parosh mere ka mb͕idi di ike. 26 (Ma Netinim nēbi n'Ofel, rue na ncherita-iru ọnu-uzọ-ama miri n'akuku ọwuwa-anyanwu, na ulo-elu nke nāputa aputa. ) 27 N'iso ya ka ndi Tekoa mere ka iberibe ọzọ atùru atù di ike, site na ncherita ulo-elu di uku nke nāputa aputa, we rue mb͕idi Ofel. 28 Site n'elu ọnu-uzọ-ama inyinya ka ndi-nchu-àjà mere ka mb͕idi di ike, nwoke ọ bula na ncherita-iru ulo-ya. 29 N'iso ha ka Zedok nwa Imea mere ka mb͕idi di ike na ncherita-iru ulo-ya. N'iso ya ka Shemaia nwa Shekania, bú onye nēche ọnu-uzọ-ama ọwuwa-anyanwu, mere ka mb͕idi di ike. 30 N'iso ya ka Hananaia nwa Shelemaia, na Hanum, bú nwa nke-isi nke Zalaf, mere ka iberibe ọzọ atùru atù di ike. N'iso ya ka Meshulam nwa Berekaia mere ka mb͕idi di ike na ncherita-iru ime-ulo-ya. 31 N'iso ya ka Malkija, bú otù onye nime ndi-nnucha-ọla, mere ka mb͕idi di ike rue ulo Netinim, na nke ndi nāzu ahia, na ncherita-iru ọnu-uzọ-ama Hamifkad, ru kwa nrigo ulo-elu nkuku. 32 N'etiti nrigo ulo-elu nkuku na ọnu-uzọ-ama aturu ka ndi-nnucha-ọla na ndi nāzu ahia mere ka ọ di ike.

Nehemaia 4

1 O rue, mb͕e Sanbalat nuru na ayi onwe-ayi nālu mb͕idi, na iwe-ya di ọku, ewe kpasue ya iwe, o we chìa ndi-Ju ọchì. 2 O kwue okwu n'iru umu-nne-ya na usu-ndi-agha Sameria, si, Gini ka ndi-Ju ndia ndi nāta aru nēme? hà gārapuru onwe-ha ihe? hà gāchu àjà? hà gēme ka ọlu-ha gwusia n'otù ubọchi? hà gēsi n'obo ájá me ka nkume di adi ọzọ, ebe nkume ahu nile bu ihe akpọworo ọku? 3 Tobaia, bú onye Amon, nọ kwa n'akuku ya, ọ si, Ọzọ, mb͕idi nke ndi ahu nālu, ọ buru na nkita-ọhia arigo n'elu ya, o gētipú kwa mb͕idi-nkume-ha. 4 Nuru, Chineke-ayi; n'ihi na ayi bu ndi eledaworo anya: Gi me kwa ka ita-uta-ha laghachi n'isi-ha, Gi rara kwa ha nye ibu ihe-nluta-n'agha n'ala ndọta-n'agha: 5 ekpuchi-kwa-la ajọ omume-ha, ekwe-kwa-la ka ehichapu nmehie-ha n'iru Gi: n'ihi na ha akpasuwo Gi iwe n'iru ndi nālu mb͕idi. 6 Ayi we lua mb͕idi ahu; ewe lukọta mb͕idi nile rue nkera idi-elu-ya: n'ihi na ndi-Ju nwere obi ilu ọlu. 7 O rue na, mb͕e Sanbalat na Tobaia na ndi Arebia na ndi Amon na ndi Ashdod nuru na anāluzu mb͕idi Jerusalem nile, na amalitere ituchi ntipú-ya nile, iwe-ha we di ọku nke-uku; 8 ha we kekọta onwe-ha, ha nile n'otù, ibia ibuso Jerusalem agha, na ikpatara ya ihe-njehie. 9 Ayi we kpere Chineke-ayi, guzo ndi-nche megide ha ehihie na abali, n'ihi ha. 10 Juda we si, Ike nke ndi-ibu ebilatawo, ma nkpọnkpọ-ihe riri nne; ayi onwe-ayi apughi kwa ilu mb͕idi. 11 Ndi nākpab͕u ayi we si, Ha agaghi-ama, ha agaghi-ahu kwa, rue mb͕e ayi batara n'etiti ha, b͕ue ha, me ka ije-ozi ahu kwusi. 12 O rue, mb͕e ndi-Ju ndi bi n'akuku ha biara, na ha siri ayi ub͕ò iri site n'ebe ahu nile, Unu gēchigharikute ayi. 13 M'we guzo ndi-ayi n'ebe nile dikarisiri ala nke ebe di nime mb͕idi, n'ebe nile sara mbara, m'we guzo ndi-ayi dika ab͕uru nile ha si di, ha na mma-agha-ha, na ube-ha, na uta-ha. 14 M'we hu, bilie, si ndi amara aha-ha, si kwa ndi nọchiri anya eze, si kwa ndi-ayi fọduru, Unu atula egwu ha: chetanu Onye-nwe-ayi, Nke di uku di kwa egwu, bu-kwa-ranu umu-nne-unu, na umu-unu ndikom, na umu-unu ndinyom, na ndinyom-unu, na ulo-unu, agha. 15 O rue na, mb͕e ndi-iro-ayi nuru na ayi mara ya, na Chineke mebi-kwa-ra ndum-ọdu ha duritara onwe-ha, ayi nile we laghachi na mb͕idi, nwoke ọ bula ije ozi-ya. 16 O rue, site n'ubọchi ahu, na nkera ndi nējerem ozi nālu ọlu n'ije-ozi ahu, ma nkera nime ha nēji ube na ọta na uta na uwe-agha; ndi-isi nọ kwa n'azu ulo Juda nile. 17 Ndi nālu mb͕idi n'elu mb͕idi ahu na ndi nēbu ibu nēbo onwe-ha ibu, nwoke ọ bula nēwere otù aka-ya lu ọlu n'ije-ozi ahu, ma otù aka-ya nēji ihe-agha-ya; 18 ndi nālu mb͕idi kwa, nwoke ọ bula na mma-agha-ya ekeworo n'úkwù-ya nọ, ha we nālu mb͕idi otú a. Onye nāfù opì-ike nọ kwa n'akukum. 19 M'we si ndi amara aha-ha, si kwa ndi nọchiri anya eze, si kwa ndi-ayi fọduru, Ije-ozi a riri nne, sa kwa mbara, ayi onwe-ayi ekewawo n'elu mb͕idi, ayi we nọ n'ebe di anya, otù nwoke n'aru nwa-nne-ya. 20 N'ebe ọ bula unu nuru olu opì-ike, n'ebe ahu ka unu gāchikọta onwe-unu n'ebe ayi nọ; Chineke-ayi gēburu ayi agha. 21 Ayi onwe-ayi we nālu ọlu n'ije-ozi ahu: ma nkera-ha nēji ube site na chi-ọbubọ rue mb͕e kpakpando putara. 22 Ọzọ, na mb͕e ahu m'siri ndi-ayi, Ka nwoke ọ bula na onye nējere ya ozi nọ ọnọdu-abali n'etiti Jerusalem, ka ha we buru ayi ndi-nche n'abali, je kwa ozi n'ehihie. 23 Ma ọ dighi onye ọ bula, ma ọ bu mu onwem, ma-ọbu umu-nnem, ma-ọbu ndi nējerem ozi, ma-ọbu ndikom nche ndi nēsom, ọ dighi onye n'etiti ayi nēyipu uwe-ya, nwoke ọ bula were ihe-agha-ya je miri.

Nehemaia 5

1 Oké iti-nkpu nke ndi-ayi na ndinyom-ha we di megide umu-nne-ha, bú ndi-Ju. 2 N'ihi na ufọdu di ndi nāsi, Ayi onwe-ayi, na umu-ayi ndikom, na umu-ayi ndinyom, di ọtutu: kwe ka ayi nara ọka, ka ayi we rie ihe, we di ndu. 3 Ufọdu di kwa ndi nāsi, Ubi-ayi nile na ubi-vine-ayi nile na ulo-ayi nile ka ayi nēdo n'ibé: kwe ka ayi nara ọka, n'ihi oké unwu a. 4 Ufọdu di kwa ndi nāsi, Ayi ewerewo ubi-ayi nile na ubi-vine-ayi nile biri ego itu utu-ala eze. 5 Ma ub͕u a dika anu-aru umu-nne-ayi ka anu-aru-ayi di, dika umu-ha ka umu-ayi di: ma, le, ayi onwe-ayi nāzọda umu-ayi ndikom na umu-ayi ndinyom ime ka ha buru ndi-orù, ufọdu di kwa n'etiti umu-ayi ndinyom ndi azọdaworo azọda: ma ayi enweghi ike nke aka-ayi; ma ndi ọzọ nwe ubi-ayi nile na ubi-vine-ayi nile. 6 Iwem we di ọku nke-uku mb͕e m'nuru iti-nkpu-ha na okwu ndia. 7 Obim we duam ọdu, mu na ndi amara aha-ha na ndi nọchiri anya eze we se okwu, m'we si ha, Ọmuru-nwa ka unu onwe-unu nānara, nwoke ọ bula n'aka nwa-nne-ya. M'we nwe nkpọkọta uku megide ha. 8 M'we si ha, Ayi onwe-ayi ab͕aputawo umu-nne-ayi, bú ndi-Ju, ndi erenyere ndi mba ọzọ, dika aka-ayi ruru; ùnu onwe-unu gēre kwa umu-nne-unu, àgērenye kwa ayi ha? Ha we b͕a nkiti, ha ahughi kwa okwu ha gāza. 9 M'we si, Ọ dighi nma, bú ihe a nke unu onwe-unu nēme: ọ̀ bughi n'egwu Chineke ka unu gējeghari, n'ihi ita-uta nke ndi mba ọzọ, bú ndi-iro-ayi? 10 Ọzọ kwa, mu onwem na umu-nnem na ndi nējerem ozi nēbinye ha ego na ọka n'ọmuru-nwa. Biko, ka ayi rapu ọmuru-nwa nka. 11 Biko, burunu uzọ nyeghachi ha ubi nile ha, na ubi-vine nile ha, na ubi-olive nile ha, na ulo nile ha, na otù uzọ n'ọgu uzọ ise nke ego, na nke ọka, na nke manya-vine ọhu, na nke manu, nke unu nānara ha n'ọmuru-nwa. 12 Ha we si, Ayi gēnyeghachi ha, ayi agaghi-achọ kwa ihe n'aka ha; otú a ka ayi gēme, dika gi onwe-gi nēkwu. M'we kpọ ndi-nchu-àjà, me ka ha ṅua iyi ime dika okwu a si di. 13 Arurupu-kwa-ram obi-uwem, si, Ka Chineke rurupu nwoke ọ bula otú a site n'ulo-ya, site kwa na ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, bú onye nādighi-eme ka okwu a guzosie ike; ọbuná otú a ya bu ihe arurupuworo, nke tọb͕ọ-kwa-ra n'efu. Nkpọkọta ahu nile we si, Amen, ha we to Jehova. Ndi-ayi we me dika okwu a si di. 14 Ọzọ, site n'ubọchi o nyerem iwu ibu onye nāchi ha n'ala Juda, site n'arọ nke-orú we rue arọ nke-orú-na-iri-na-abua nke Ataksakses, bú eze, nke ahu bu arọ iri na abua, mu onwem na umu-nnem erighi nri nke onye nāchi ala. 15 Ma ndi mbu nāchi ala ndi burum uzọ, ha bob͕uru ndi-Ju ibu arọ́, we nara ha utu n'achicha na manya-vine, tiyere ọgu shekel ọla-ọcha abua; ọbuná ndi nējere ha ozi bu ndi-isi n'ebe ndi-ayi nọ: ma mu onwem emeghi otú a, n'ihi egwu Chineke. 16 Ọzọ kwa, m'jisiri ike n'ije-ozi mb͕idi a, ọ dighi kwa ubi ayi zutara: ma achikọtawo ndi nile nējerem ozi n'ebe ahu ije ozi ahu. 17 Ọzọ, ndi-Ju na ndi nọchiri anya eze, bú ọgụ ndikom asa na iri, nọ na table nkem, ha na ndi nābiakute ayi site na mba ndi di ayi buruburu. 18 Ma ihe nke edoziworo bayere otù ubòchi bu otù ehi na aturu isi arọputara arọputa; edozi-kwa-ra umu-nnunu nyem, dozi kwa manya-vine nile ọ bula n'uba otù ub͕ò n'ubọchi iri: ma n'ihe a nile ọ dighi nri nke diri onye nāchi ala m'chọrọ, n'ihi na òfùfè ahu di arọ́ n'aru ndi nka. 19 Chinekem, chetaram ihe nile nke m'meworo n'ihi ndi nka, imerem ezi ihe.

Nehemaia 6

1 O rue, mb͕e Sanbalat, na Tobaia, na Geshem, bú onye Arebia, na ndi-iro-ayi fọduru, nuru na m'lusiri mb͕idi ahu, na ọ dighi kwa ntipú fọduru nime ya; (ọ bu ezie na akaghm-eguzo ibo-ọnu-uzọ n'ọnu-uzọ-ama nile rue mb͕e ahu; ) 2 o rue, na Sanbalat na Geshem ziterem ozi, si, Bia, ka ayi zukọta n'otù n'obodo ntà nime ndagwurugwu nke Ono. Ma ndi ahu nēchè èchìchè imejọm emejọ. 3 M'we zigara ha ndi-ozi, si, Ozi uku ka m'nēje, apughkwam irida: n'ìhi gini ka ozi a gākwusi, mb͕e m'nārapu ya, we ridakuru unu? 4 Ha we ziterem ozi ub͕ò anọ dika okwu a si di; m'we zaghachi ha okwu dika okwu a si di. 5 Sanbalat we ziterem onye nējere ya ozi nke ub͕ò ise dika okwu a si di, ya na akwukwọ-ozi nke emegheworo n'aka-ya; 6 edewo nime ya, si, Anuwo ya n'etiti mba nile ọzọ, Gashmu nāsi kwa, na gi onwe-gi na ndi-Ju nēchè èchìchè inupu isi; n'ihi nka ka gi onwe-gi nālu mb͕idi ahu: gi onwe-gi aghọwo-kwa-ra ha eze, dika okwu ndia si di. 7 Ọzọ kwa, i guzowo ndi-amuma ikpọsa òkù bayere gi nime Jerusalem, si, Eze di nime Juda: ma ub͕u a eze gānu ya dika okwu ndia si di. Ma ub͕u a bia, ka ayi durita onwe-ayi ọdu. 8 M'we zigara ya ozi, si, Ọ dighi ka okwu ndia si di nke gi onwe-gi nēkwu, kama gi onwe-gi nēchèputa ha n'obi-gi. 9 N'ihi na ha nile nēme ka ayi tua egwu, si, Aka-ha gākudapu n'ije-ozi a, agaghi-eje kwa ya. Ma ub͕u a Gi me ka akam abua di ike. 10 Ma mu onwem batara n'ulo Shemaia nwa Delaia nwa Mehetabel, ma emechidoworo onye ahu uzọ; o we si, Ka ayi zukọta n'ulo Chineke, n'etiti ulo uku Chineke, ka ayi mechi kwa uzọ nile nke ulo uku Chineke: n'ihi na ha nābia ib͕u gi; e, n'abali ka ha nābia ib͕u gi. 11 M'we si, Nwoke dika mu onwem, ọ̀ gāb͕alaga? ònye di kwa, nke di ka mu onwem, nke gābà n'ulo uku Chineke, we di ndu? m'gaghi-abà nime. 12 M'we mata, ma, le, ọ bughi Chineke zitere ya: kama okwu amuma nka ka o kwuru imegidem: ma Sanbalat na Tobaia goro ya. 13 N'ihi nka ka egoro onye ahu, ka m'we tua egwu, me otú a, we mehie, ka ha we nwe kwa ya inyem aha ọjọ, ka ha we tam uta. 14 Chinekem, cheta Tobaia, cheta kwa Sanbalat, dika omume-ha ndia si di, ọzọ kwa, cheta Noadia, bú onye-amuma-nwayi, cheta kwa ndi-amuma fọduru, ndi nēme ka m'tua egwu. 15 Ewe luzue mb͕idi ahu n'ubọchi nke-orú-na-ise nke ọnwa Elul, n'ọgu ubọchi abua na iri na abua. 16 O rue, mb͕e ndi-iro-ayi nile nuru ya, na mba nile nke di ayi buruburu turu egwu, we da ada nke-uku n'anya nke aka ha: ha we mara na esitere n'aka Chineke-ayi je ozi a. 17 Ọzọ, na mb͕e ahu ndi Juda amara aha-ha nēzigara Tobaia ọtutu akwukwọ-ozi, akwukwọ-ozi nke Tobaia nābiaru kwa ha aka. 18 N'ihi na ọtutu madu di nime Juda ndi nwere iyi ha ṅuru ya, n'ihi na di nwa-nwayi Shekania nwa Ara ka ọ bu; Jehohanan nwa-ya lu-kwa-ra nwa-nwayi Meshulam nwa Berekaia na nwunye. 19 Ha nēkwu kwa okwu bayere ezi omume-ya nile n'irum, ha nēburu kwa okwum nile pukuru ya. Akwukwọ-ozi ka Tobaia ziri ime ka m'tua egwu.

Nehemaia 7

1 O rue, mb͕e alusiri mb͕idi ahu, mb͕e m'guzosi-kwa-ra ibo-ọnu-uzọ-ya nile, mb͕e emesi-kwa-ra ndi-ọnu-uzọ-ama na ndi-ọbù-abù na ndi-Livai ka ha lekọta ozi-ha, 2 na m'nyere Hanani, bú nwa-nnem, na Hananaia, bú onye-isi ulo uku eze, iwu bayere Jerusalem: n'ihi na onye ahu bu onye ezi-okwu, ọ nātu kwa egwu Chineke kari ọtutu madu. 3 M'we si ha, Ka aghara imeghepu ọnu-uzọ-ama Jerusalem rue mb͕e anyanwu di ọku; na mb͕e ndi-nche nēguzo kwa na nche-ha, ka ha mechie uzọ, kpọchi-kwa-nu ha: guzo kwa ndi bi na Jerusalem na nche, nwoke ọ bula nime nche-ya, nwoke ọ bula kwa na ncherita-iru ulo-ya. 4 Ma obodo ahu sara mbara n'aka abua, di kwa uku: ma ndi-ayi di ole-na-ole n'etiti ya, ulo adighi kwa nke ewuru ewu. 5 Chinekem we tiye ya n'obim, m'we chikọta ndi amara aha-ha, na ndi nọchiri anya eze, na ndi-ayi nile, ka ewe de ha n'akwukwọ-osuso-ọmumu. M'we chọta akwukwọ osuso-ọmumu nke ndi rigotaworo na mbu, m'we hu ihe a edeworo nime ya: 6 Ndia bu umu ala ahu anāchi achi, ndi nārigo, bú ndi sitere na ndọta-n'agha ahu nke ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ndi Nebukadneza, bú eze Babilon, mere ka ha je biri n'ala ọzọ, ha we lata na Jerusalem, lata kwa na Juda, nwoke ọ bula n'obodo-ya; 7 ndi nābia, ha na Zerubabel, na Jeshua, na Nehemaia, na Azaraia, na Raamia, na Nahamani, na Mọdekai, na Bilshan, na Misperet, na Bigvai, na Nehum, na Beana. Ọnu-ọgugu ndikom nke ndi Israel: 8 Umu Parosh, nnù ise na ọgu asatọ na iri na abua. 9 Umu Shefataia ọgu iri-na-asatọ na iri na abua. 10 Umu Ara, nnù na ọgu iri-na-abua na iri na abua. 11 Umu Pahat-moab, nke umu Jeshua na Joab, nnù asa na iri na asatọ. 12 Umu Ilam, nnù atọ na ọgu abua na iri na anọ. 13 Umu Zatu, nnù abua na ọgu abua na ise. 14 Umu Zakai, nnù na ọgu iri-na-asatọ. 15 Umu Binui, nnù na ọgu iri-na-abua na asatọ. 16 Umu Bebai, nnù na ọgu iri-na-otù na asatọ. 17 Umu Azgad, nnù ise na ọgu iri-na-isi na abua. 18 Umu Adonikam, nnù na ọgu iri-na-atọ na asa. 19 Umu Bigvai, nnù ise na ọgu atọ na asa. 20 Umu Adin, nnù na ọgu iri-na-abua na iri na ise. 21 Umu Atea, nke Hezekaia, ọgu anọ na iri na asatọ. 22 Umu Hashum, ọgu iri-na-isi na asatọ. 23 Umu Bezai, ọgu iri-na-isi na anọ. 24 Umu Harif, ọgu ise na iri na abua. 25 Umu Gibeon, ọgu anọ na iri na ise. 26 Ndikom Bet-lehem na Netofa, ọgu iteghete na asatọ. 27 Ndikom Anatot, ọgu isi na asatọ. 28 Ndikom Bet-azmavet, ọgu abua na abua. 29 Ndikom Kiriat-jearim na Kefira na Beirot, nnù na ọgu iri-na-asa na atọ. 30 Ndikom Rema na Geba, nnù na ọgu iri-na-otù na otù. 31 Ndikom Mikmas, ọgu isi na abua. 32 Ndikom Bet-el na Ai, ọgu isi na atọ. 33 Ndikom Nebo nke-ọzọ, ọgu abua na iri na abua. 34 Umu Ilam nke-ọzọ, nnù atọ na ọgu abua na iri na anọ. 35 Umu Harim, ọgu iri-na-isi. 36 Umu jeriko, ọgu iri-na-asa na ise. 37 Umu Lod na Hadid na Ono, nnù n' ọgu na iri-na-isi na otù. 38 Umu Senaa, nnù iteghete na ọgu iri-na-isi na iri. 39 Ndi-nchu-àjà: umu Jedaia, nke ulo Jeshua, nnù abua na ọgu asatọ na iri na atọ. 40 Umu Imea, nnù abua na ọgu iri-na-abua na iri na abua. 41 Umu Pashua, nnù atọ na ọgu abua na asa. 42 Umu Harim, nnù abua na ọgu iri na iri na asa. 43 Ndi Livai: umu Jeshua, nke Kadmiel, nke umu Hodeva, ọgu atọ na iri na anọ. 44 Ndi ọbù-abù: umu Esaf, ọgu asa na asatọ. 45 Ndi-ọnu-uzọ-ama: umu Shalum, na umu Atea, na umu Talmon, na umu Akub, na umu Hatita, na umu Shobai, ọgu isi na iri na asatọ. 46 Netinim: umu Ziha, na umu Hasufa, na umu Tabaot; 47 na umu Keros, na umu Sia, na umu Padon; 48 na umu Lebana, na umu Hagaba, na umu Salmai; 49 na umu Hanan, na umu Gidel, na umu Gaha; 50 na umu Reaia, na umu Rezin, na umu Nekoda; 51 na umu Gazam, na umu Uza, na umu Pasea; 52 na umu Besai, na umu Meunim, na umu Nefushesim; 53 na umu Bakbuk, na umu Hakufa, na umu Hahua; 54 na umu Bazlit, na umu Mehida, na umu Hasha; 55 na umu Bakos, na umu Sisera, na umu Tema; 56 na umu Nezia, na umu Hatifa. 57 Umu ndi-orù Solomon: umu Sotai, na umu Soferet, na umu Perida; 58 na umu Jaala, na umu Dakon, na umu Gidel; 59 na umu Shefataia, na umu Hatil, na umu Pokeret-hazebaim, na umu Emon. 60 Netinim nile, na umu ndi-orù Solomon, di ọgu iri-na-iteghete na iri na abua. 61 Ndia bu kwa ndi nārigo site na Tel-mela na Tel-hasha na Kerub na Adon na Imea: ma ha apughi igosi ulo nke ndi bu nna-ha, ma-ọbu nkpuru-ha, ma ọ bu Israel ka ha siri puta: 62 umu Delaia, na umu Tobaia, na umu Nekoda, nnù na ọgu iri-na-abua na abua. 63 Site kwa na ndi-nchu-àjà: umu Họbaia, na umu Hakoz, na umu Bazilai, onye luru nwunye sitere n'umu-ndinyom Bazilai, bú onye Gilead, ewe kpọ ya aha n'aha-ha. 64 Ndia chọrọ odide-akwukwọ-ha n'etiti ndi edere n'akwukwọ-osuso-ọmumu, ma achọtaghi ya: ewe gua ha na ndi nādighi nsọ, ewe wepu ha n'ọlu-nchu-àjà. 65 Tiashata we si ha, ka ha ghara iri ihe n'ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile, rue mb͕e onye-nchu-àjà gēwere Ìhè na Izu-okè guzo. 66 Nkpọkọta ahu nile n'otù di orú nnù uzọ ise na nnù ise na ọgu iri-na-asatọ, 67 nāgughi orù-ha ndikom na orù-ha ndinyom, ndi di nnù iri-na-asatọ na ọgu isi na iri na asa: ha nwe-kwa-ra ọgu madu iri-na-abua na ise bu ndikom nābù abù na ndinyom nābù abù. 68 Inyinya-ha di nnù na ọgu iri-na-isi na iri na isi; inyinya mule ha di ọgu iri-na-abua na ise; 69 camel-ha di nnù na orú na iri na ise; inyinya-ibu-ha di nnù iri-na-isi na ọgu iri-na-isi. 70 Ma ufọdu n'etiti ndi-isi ulo nke ndi bu nna nyere onyinye nke diri ije-ozi ahu. Tiashata tiyere n'ulo-àkù nnù daric ọla-edo abua na ọgu iri, na ọgu ọkwa-nwusa abua na iri, na nnù uwe ndi-nchu-àjà na ọgu isi na iri. 71 Ma ufọdu n'etiti ndi-isi ulo nke ndi bu nna tiyere n'ulo-àkù nke ije-ozi ahu orú nnù daric ọla-edo uzọ abua na nnù iri, na nnù pound ọla-ọcha ise na ọgu iri. 72 Ma nke ndi-ayi fọduru nyere di orú nnù daric ọla-edo uzọ abua na nnù iri, na nnù pound ọla ọcha ise, na ọgu uwe ndi-nchu-àjà atọ na asa. 73 Ndi-nchu-aja, na ndi Livai, na ndi-ọnu-uzọ-ama, na ndi-ọbù-abù, na ufọdu nime ndi Juda, na Netinim, na Israel nile, we biri n'obodo nile ha. Ọnwa nke-asa we rue, umu Israel nọ kwa n'obodo nile ha.

Nehemaia 8

1 Ndi ahu nile we chikọta onwe-ha dika otù onye rue amá nke di n'iru ọnu-uzọ-ama miri; ha we si Ezra, bú ode-akwukwọ, ka o weta akwukwọ iwu Moses, nke Jehova nyere Israel n'iwu. 2 Ezra, bú onye-nchu-àjà, we weta iwu ahu n'iru nkpọkọta Israel, ma ndikom ma ndinyom, ma onye ọ bula nke nāghọta inu ihe, n'ubọchi mbu nke ọnwa nke-asa. 3 O we gua nime ya n'iru amá nke di n'iru ọnu-uzọ-ama miri site oge ututu rue etiti-ehihie, n'iru ndikom na ndinyom na ndi nāghọta ihe; ndi ahu nile we ṅa nti akwukwọ iwu ahu. 4 Ezra, bú ode-akwukwọ, we guzo n'elu ulo-elu osisi, nke ha mere bayere ihe a; Matitaia, na Shema, na Anaia, na Uraia, na Hilkaia, na Maaseia, we guzo n'akuku ya, n'aka-nri-ya; Pedaia kwa, na Mishael, na Malkija, na Hashum, na Hashbadana, na Zekaraia, na Meshulam, n'aka-ekpe-ya. 5 Ezra we saghe akwukwọ n'anya ndi ahu nile; (n'ihi na ọ nọ n'elu n'ebe ndi ahu nile nọ; ) ma mb͕e ọ saghere ya, ndi ahu nile guzoro: 6 Ezra we gọzie Jehova, bú Chineke uku. Ndi ahu nile we za, si, Amen, Amen, n'ichili aka-ha elu: ha we rube isi-ha, kpọ isi ala nye Jehova, kpue iru-ha n'ala. 7 Ọzọ, Jeshua, na Bani, na Sherebia, na Jamin, na Akub, na Shabetai, na Hodia, na Maaseia, na Kelita, na Azaraia, na Jozabad, na Hanan, na Pelaia, na ndi Livai, mere ka ndi ahu ghọta iwu ahu: ndi ahu nēguzo kwa n'ebe-nguzo-ha. 8 Ha wee gua n'akwukwọ ahu, bú n'iwu Chineke, guputa ya nke-ọma, we me ka amata isi-ya, ha we ghọta ọgugu-ya. 9 Nehemaia, nke ya onwe-ya bu Tiashata, na Ezra onye-nchu-àjà, bú ode-akwukwọ, na ndi Livai, bú ndi nēzí ndi ahu ihe, we si ndi ahu nile, Ta, ihe nsọ nke diri Jehova, bú Chineke-unu, ka ọ bu; unu erula újú, akwa-kwa-la ákwá. N'ihi na ndi ahu nile nākwa ákwá, mb͕e ha nuru okwu nile nke iwu ahu. 10 O we si ha, Jerenu onwe-unu, rie ihe mara abuba, ṅua ihe-ọṅuṅu di utọ, were òkè zigara ndi ọ nādighi ihe edoziworo ha: n'ihi na nsọ ka ubọchi ta diri Onye-nwe-ayi: ihe ewuta-kwa-la unu; n'ihi na ọṅù Jehova bu ike-unu. 11 Ndi Livai we nēme ka ndi ahu nile b͕a nkiti, si, Nọdunu du, n'ihi na ubọchi a di nsọ, ihe ewuta-kwa-la unu. 12 Ndi ahu nile we je iri ihe, na iṅu ihe ọṅuṅu, na iziga òkè, na ime ka oké ọṅù di, n'ihi na ha ghọtara okwu nile nke emere ka ha mara. 13 Ma n'ubọchi nke-abua achikọtara ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi ahu nile, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, n'ebe Ezra, bú ode-akwukwọ, nọ, ọbuná inwe uche bayere okwu nile nke iwu ahu. 14 Ha we chọputa ihe a edeworo n'iwu, bú na Jehova nyere iwu site n'aka Moses, ka umu Israel nọdu n'ulo-ntu n'ememe di n'ọnwa nke-asa: 15 na ka eme ka anu ka ekwusa kwa n'obodo-ha nile na nime Jerusalem, si, Puanu je n'ugwu, chita akwukwọ osisi olive, na akwukwọ osisi nēnye manu, na akwukwọ osisi myrtle, na igu nkwu, na akwukwọ nke osisi b͕ara n'ọhia, ime ulo-ntu, dika edeworo ya n'akwukwọ. 16 Ndi ahu we je, chita ha, mere onwe-ha ulo-ntu, nwoke ọ bula n'elu-ulo-ya, na n'ogige nile ha, na n'ogige nile nke ulo Chineke, na n'amá nke ọnu-uzọ-ama miri, na n'amá nke ọnu-uzọ-ama Efraim. 17 Nkpọkọta ahu nile nke ndi nālata site na ndọta-n'agha ahu mere ulo-ntu, we nọdu n'ulo-ntu-ha: n'ihi na umu Israel emeghi otú a site n'ubọchi Jeshua nwa Nun rue ubọchi ahu. Oké ọṅù di uku we di. 18 O we nāgu n'akwukwọ iwu Chineke kwa-ubọchi, site n'ubọchi mbu rue ubọchi ikpe-azu. Ha we me ememe ahu ubọchi asa; ma n'ubọchi nke-asatọ ubọchi-nb͕ochi di, dika ikpé-ya si di.

Nehemaia 9

1 Ma n'ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa nka achikọtara umu Israel n'obubu-ọnu, na n'ákwà-nke, ájá dikwasi kwa ha. 2 Nkupuru Israel we kewaputa onwe-ha n'aru ndi ala ọzọ nile, guzo, kwuputa nmehie nile ha, na ajọ omume nile nke ndi bu nna-ha. 3 Ha we bilie n'ebe-nguzo-ha, gua n'akwukwọ iwu Jehova, bú Chineke-ha, otù uzọ n'uzọ anọ nke ubọchi; otù uzọ n'uzọ anọ kwa ka ha nēkwuputa, nākpọ kwa isi ala nye Jehova, bú Chineke-ha. 4 Jeshua, na Bani, na Kadmiel, na Shebania, na Buni, na Sherebia, na Bani, na Kenani, we bilie n'elu ihe-nrigo ndi Livai, were oké olu tikue Jehova, bú Chineke-ha. 5 Ndi Livai, bú Jeshua, na Kadmiel, na Bani, na Hashabneia, na Sherebia, na Hodia, na Shebania, na Petahia, we si, Bilienu, gọzie Jehova, bú Chineke-unu, site na mb͕e edighi-ebi rue mb͕e ebighi-ebi: ka ha gọzi kwa aha-Gi di nsọpuru, nke ebuliworo ya elu kari ngọzi na otuto nile. 6 Gi onwe-gi bu Jehova, nání Gi; Gi onwe-gi emewo elu-igwe, bú elu-igwe nke elu-igwe nile, na usu-ha nile, na uwa na ihe nile nke di n'elu ya, na oké osimiri nile na ihe nile nke di nime ha, Gi onwe-gi nēdebe kwa ha nile ndu; usu ihe elu-igwe nākpọ kwa isi ala nye Gi. 7 Gi onwe-gi, Jehova, bu Chineke ahu Nke rọputara Abram, me ka o si na Ua nke ndi Kaldea puta, I gu-kwa-ra aha-ya Abraham; 8 I hu-kwa-ra na obi-ya kwesiri ntukwasi-obi n'iru Gi, Gi na ya b͕a-kwa-ra ndu na I gēwere ala nke ndi Kenean na ndi Het na ndi-Amorait na ndi Perizait na ndi Jebus na ndi-Giagashait nye, bú iwere ya nye nkpuru-ya, I we me ka okwu-Gi guzosie ike; n'ihi na onye ezi omume ka I bu. 9 I hu-kwa-ra mweda-n'ala nke nna-ayi-hà n'Ijipt, nu kwa iti-nkpu-ha n'akuku Oké Osimiri Uhie; 10 I we tiye ihe-iriba-ama na ihe-ebube n'aru Fero, na n'aru ndi-orù-ya nile, na n'aru ndi nile nke ala-ya; n'ihi na I mara na ha were nganga megide ha; I we mere Onwe-gi aha, dika o si di ta. 11 I kewa-kwa-ra oké osimiri n'iru ha, ha we gabiga n'etiti oké osimiri n'elu ala-akọrọ; ma I tubàra ndi nāchu ha na miri di omimi, dika nkume nime miri di ike. 12 Ọ bu kwa ogidi igwe-oji ka I nēwere du ha n'ehihie; I nēwere kwa ogidi ọku n'abali, inye ha ìhè n'uzọ ahu nke ha gēje ije nime ya. 13 Ọ bu kwa n'elu ugwu Sainai ka I ridara, si n'elu-igwe kpayere ha uka, I we nye ha ikpé ziri ezi na iwu ezi-okwu, na ezi ukpuru na ihe enyere n'iwu: 14 I me-kwa-ra ka ha mara ubọchi-izu-ike nsọ Gi, I were kwa ihe enyere n'iwu, na ukpuru, na iwu, nye ha n'iwu site n'aka Moses, bú orù-Gi: 15 ọ bu kwa nri nke sitere n'elu-igwe ka I nyere ha bayere agu-ha, me kwa ka miri si na nkume di elu putara ha bayere akpiri-ikpọ-nku-ha, I si-kwa-ra ha ba nime inweta ala ahu nke I weliri aka-Gi inye ha. 16 Ma ndi ahu na nna-ayi-hà mere ihe na nganga, kwesie olu-ha ike, ha egeghi kwa nti ihe nile I nyere n'iwu, 17 ha we ju inu ihe, ha echetaghi kwa oké ọlu-Gi nile nke I luru n'etiti ha; ha we kwesie olu-ha ike, do onye-isi nime nnupu-isi-ha ilaghachi n'ọbubu-orù-ha: ma Gi onwe-gi bu Chineke nke nb͕aghara nmehie, Onye nēme amara nwe kwa obi-ebere, Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ, Onye nāba uba n'ebere, I rapughi kwa ha. 18 Ọbuná mb͕e ha mere nwa-ehi awuru awu nye onwe-ha, si, Nka bu chi-gi nke mere ka i si n'Ijipt rigoputa, ha we me oké ihe-nlelì-anya; 19 ma Gi onwe-gi n'ọtutu obi-ebere-Gi arapughi ha n'ọzara: ogidi igwe-oji esighi n'elu ha wezuga onwe-ya n'ehihie, idu ha n'uzọ-ha; ogidi ọku ewezugaghi kwa onwe-ya n'abali, inye ha na uzọ ahu nke ha nēje ije nime ya ìhè. 20 I nye-kwa-ra ezi Mọ nke Gi ime ka ha nwe uche, I b͕ochighi kwa manna-Gi n'ọnu-ha, I nye-kwa-ra ha miri bayere akpiri-ikpọ-nku-ha. 21 Ọ bu kwa ọgu arọ abua ka I zùru ha n'ọzara, ọ dighi kwa ihe kọrọ ha; uwe-ha akaghi nká, ukwu-ha azaghi kwa aza. 22 Ọzọ, I nyere ha ala-eze na ndi di iche iche, we kè ha n'òkè n'òkè n'akuku nile: ha we nweta ala Saihon, bú ala nke eze Heshbon, na ala Og, bú eze Beshan. 23 I me-kwa-ra ka umu-ha ba uba dika kpakpando nke elu-igwe, I we me ka ha ba n'ala ahu nke I siri ndi bu nna-ha ka ha ba inweta ya. 24 Umu-ha we ba, nweta ala ahu, I we ruru ndi bi n'ala ahu, bú ndi Kenean, ala n'iru ha, were ha, na ndi-eze-ha, na ndi di iche iche nke ala ahu, nye n'aka-ha, ka ha were ha me dika ọ tọrọ ha utọ 25 Ha we were obodo di iche iche ewusiri ike, na ala nwere ume, ha nweta-kwa-ra ulo juputara n'ezi ihe nile, na olùlù-miri egwuwara egwuwa, na ubi-vine, na ubi-olive, na ọtutu osisi nāmi nkpuru anēri eri: ha we rie ihe, afọ ju-kwa-ra ha, ha we gba abuba, ezi ihe uku Gi we tọ ha utọ. 26 Ma ha juru Gi aju, nupu isi megide Gi, tufue iwu-Gi n'azu ha, b͕ue ndi-amuma-Gi ndi b͕ara àmà megide ha ime ka ha chigharikute Gi, ha we me oké ihe-nlelì. 27 I we nye ha n'aka ndi nākpab͕u ha, ha we kpab͕ue ha: ma na mb͕e nkpab͕u-ha, ha we tikue Gi, Gi onwe-gi we site n'elu-igwe nu, nye ha ndi-nzọputa dika ọtutu obi-ebere-Gi nile si di, ha we zọputa ha n'aka ndi nākpab͕u ha. 28 Ma mb͕e izu-ike diri ha, ha me-kwa-ra ihe ọjọ n'iru Gi ọzọ: I we rapu ha n'aka ndi-iro-ha, ha we nwe ike n'aru ha: ha we laghachi, tikue Gi, Gi onwe-gi we site n'elu-igwe nu, naputa ha ọtutu ub͕ò dika obi-ebere-Gi si di, 29 I we b͕a àmà megide ha, ime ka ha lata n'iwu-Gi: ma ndi ahu mere ihe na nganga, ha egeghi kwa nti ihe nile I nyere n'iwu, kama ha mehiere megide ikpé-Gi nile, (nke madu nēme nādi kwa ndu nime ha, ) ha we wezuga ubu-ha, kwesie olu-ha ike, ha anughi kwa. 30 Ma I nēme ka ọtutu arọ di ogologo n'isi ha, I we were Mọ-Gi b͕a àmà megide ha site n'aka ndi-amuma-Gi: ma ha aṅaghi nti: I we nye ha n'aka ndi di iche iche nke ala ọzọ. 31 Ma n'ọtutu obi-ebere-Gi I meghi ka ha gwusia, I rapughi kwa ha; n'ihi na Chineke Nke nēme amara, Nke nwe kwa ra obi-ebere, ka I bu. 32 Ma ub͕u a, Chineke-ayi, Chineke uku, Nke bu dike, Nke di kwa egwu, Gi Onye nēdebe ọb͕ub͕a-ndu na ebere, ka ike-ọgwugwu nile ghara idi ntà n'iru Gi, bú nke gwuworo ayi, gwu kwa ndi-eze-ayi, gwu kwa ndi-isi-ayi, gwu kwa ndi-nchu-àjà-ayi, gwu kwa ndi-amuma-ayi, gwu kwa nna-ayi-hà, gwu kwa ndi-Gi nile, site n'ubọchi ndi-eze Asiria rue ta. 33 Ma Gi onwe-gi bu onye ezi omume bayere ihe nile nke biakwasiworo ayi; n'ihi na ihe bu ezi-okwu ka I meworo, ma ayi onwe-ayi emebiwo iwu: 34 ndi-eze-ayi, na ndi-isi-ayi, na ndi-nchu-àjà-ayi, na nna-ayi-hà, ha emeghi kwa iwu-Gi, ha aṅaghi kwa nti n'ihe nile I nyere n'iwu na n'àmà-Gi nile, nke I b͕ara megide ha. 35 Ha onwe-ha efèghi kwa Gi n'ala-eze-ha, na n'ezi ihe-Gi bara uba nke I nyere ha, na n'ala ahu sara mbara nke nwe-kwa-ra ume, nke I tiyere n'iru ha, ha esighi kwa n'omume ọjọ nile ha chigharia. 36 Le, ayi onwe-ayi bu ndi-orù ta, ma ala ahu nke I nyere nna-ayi-hà iri nkpuru-ya na ezi ihe-ya, le, ayi onwe-ayi bu ndi-orù nime ya. 37 Ọ nēme-kwa-ra ndi-eze ọtutu ihe-ọmume, bú ndi I doro ndi-isi-ayi n'ihi nmehie nile ayi: ha nāchi kwa aru-ayi, na n'etiti anu-ulo-ayi, dika ọ nātọ ha utọ, ọ bu kwa na nkpab͕u uku ka ayi nọ. 38 Ma n'ihi ihe a nile ka ayi onwe-ayi nēme ọb͕ub͕a-ndu kwesiri ntukwasi-obi, ayi nēde kwa ya n'akwukwọ; ndi-isi-ayi na ndi Livai ayi na ndi-nchu-àjà-ayi bu kwa ndi-isi n'ikà ihe ahu akara akàrà.

Nehemaia 10

1 Ma ndi bu ndi-isi n'ikà ihe nile akara akàrà bu, Nehemaia, bú Tiashata, nwa Hakalaia, na Zedekaia; 2 na Seraia, na Azaraia, na Jeremaia; 3 na Pashua, na Amaraia, na Malkija; 4 na Hatush, na Shebania, na Maluk; 5 na Harim, na Meremot, na Obadaia; 6 na Daniel, na Gineton, na Beruk; 7 na Meshulam, na Abaija, na Mijamin; 8 na Maazia, na Bilgai, na Shemaia; ndia bu ndi-nchu-àjà. 9 Ndi Livai kwa: bú Jeshua nwa Azania, na Binui nke sitere n'umu Henadad, na Kadmiel; 10 na umu-nne-ha, bú Shebania, na Hodia, na Kelita, na Pelaia, na Hanan; 11 na Maika, na Rehob, na Hashabaia; 12 na Zakua, na Sherebia, na Shebania; 13 na Hodia, na Bani, na Beninu. 14 Ndi-isi ndi Israel: bú Parosh, na Pahat-moab, na Ilam, na Zatu, na Bani; 15 na Buni, na Azgad, na Bebai; 16 na Adonaija, na Bigvai, na Adin; 17 na Atea, na Hezekaia, na Azua; 18 na Hodia, na Hashum, na Bezai; 19 na Harif, na Anatot, na Nobai; 20 na Magpiash, na Meshulam, na Hezia; 21 na Meshezabel, na Zedok, na Jadua; 22 na Pelataia, na Hanan, na Anaia; 23 na Hoshea, na Hananaia, na Hashub; 24 na Halohesh, na Pilha, na Shobek; 25 na Rehum, na Hashabna, na Maaseia; 26 na Ahia, na Hanan, na Anan; 27 na Maluk, na Harim, na Beana. 28 Ndi-ayi fọduru, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na ndi-ọnu-uzọ-ama, na ndi-ọbù-abù, na Netinim, na onye ọ bula nke siworo n'etiti ndi iche iche nke ala ọzọ kewapuru iwu Chineke onwe-ya, ha na ndinyom-ha, na umu-ha ndikom, na umu-ha ndiyom, onye ọ bula nke mara ihe, nke nāghọta kwa ihe; 29 ha nēkekọta onwe-ha n'aru umu-nne-ha, bú ndi-ha di ebube, ha nābà kwa n'ọb͕ub͕a-iyi na n'ọṅuṅu-iyi, ijeghari n'iwu Chineke, nke enyere site n'aka Moses, bú orù Chineke, na idebe na ime ihe nile Jehova, bú Onye-nwe-ayi, nyere n'iwu, na ikpé-Ya nile na ukpuru-Ya nile; 30 ọzọ kwa, na ayi agaghi-enye ndi di iche iche nke ala ahu umu-ayi ndinyom, na ayi agaghi-aluta-kwa-ra umu-ayi ndikom umu-ha ndinyom: 31 ọzọ, ndi di iche iche nke ala ahu ndi nēwebata ihe-ahia na ọka ọ bula n'ubọchi-izu-ike ire ere, na ayi agaghi-azuru n'aka-ha n'ubọchi-izu-ike, ma-ọbu n'ubọchi nsọ: ọzọ, na ayi gārapu arọ nke-asa na ihe-nbinye ọ bula. 32 Ayi me-kwa-ra ihe enyere n'iwu ka ha guzoro ayi, bú ibokwasi onwe-ayi otù uzọ n'uzọ atọ nke otù shekel n'arọ iji fè òfùfè ulo Chineke-ayi; 33 bayere achicha anēdebe n'usoro, na onyinye-inata-iru-ọma anēnye mb͕e nile, baye-kwa-ra àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e nile, nke ubọchi-izu-ike nile, na nke ọnwa ọhu nile, bayere mb͕e nile akara àkà, baye-kwa-ra ihe nsọ nile, baye-kwa-ra àjà-nmehie nile ikpuchiri Israel nmehie, bú ije-ozi nile nke ulo Chineke-ayi. 34 Ayi fe-kwa-ra nzà, bú ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na ndi-ayi nile, bayere onyinye iji biaru nso, bú nkú, iwebata ya n'ulo Chineke-ayi, dika ulo nna-ayi-hà si di, na mb͕e ezubere, kwa-arọ, isure n'elu ebe-ichu-àjà Jehova, bú Chineke-ayi, dika edeworo ya n'iwu: 35 na iwebata nkupuru mbu nke ala-ubi-ayi, na nkpuru mbu nke nkpuru nile nke osisi nile, kwa-arọ, n'ulo Jehova: 36 na umu eburu uzọ mu nke umu-ayi ndikom na nke anu-ulo-ayi, dika edeworo ya n'iwu, na umu eburu uzọ mu nke ìgwè ehi-ayi na nke ìgwè ewu na aturu-ayi, iwebata ha n'ulo Chineke-ayi, nye ndi-nchu-àjà ndi nēje ozi n'ulo Chineke-ayi: 37 na ayi gēwebata-kwa-ra ndi-nchu-àjà utu ọka mbu ayi, na àjà-nbuli nile ayi, na nkpuru nke osisi nile ọ bula, na manya-vine ọhu, na manu, rue ime-ulo nke ulo Chineke-ayi; webata-kwa-ra ndi Livai otù uzọ n'uzọ iri nke ihe ala-ubi-ayi; n'ihi na ha onwe-ha, bú ndi Livai, nānara otù uzọ n'uzọ iri n'obodo nile nke ọlu-ubi-ayi. 38 Onye-nchu-àjà, bú nwa Eron, gānọye-kwa-ra ndi Livai, mb͕e ndi Livai nānara otù uzọ n'uzọ iri: ndi Livai gēwegota kwa otù uzọ n'uzọ iri nime otù uzọ n'uzọ iri nile rue ulo Chineke-ayi, rue ime-ulo, rue ulo àkù. 39 N'ihi na umu Israel na umu Livai gēwebata àjà-nbuli nke ọka na manya-vine ọhu na manu n'ime-ulo, ọ bu kwa n'ebe ahu ka ihe nile nke ebe nsọ di, ha na ndi-nchu-àjà ndi nēje ozi, na ndi-ọnu-uzọ-ama, na ndi-ọbù-abù: ayi agaghi-arapu kwa ulo Chineke-ayi.

Nehemaia 11

1 Ndi-isi ndi-Ju we biri na Jerusalem: ndi-Ju fọduru fe-kwa-ra nzà, ime ka otù onye nime madu iri bata ibi na Jerusalem, bú obodo nsọ, ka uzọ iteghete ndi fọduru biri kwa n'obodo ọzọ. 2 Ndi-Ju we gọzie ndikom ahu nile ndi were afọ-ofufo nye onwe-ha ibi na Jerusalem. 3 Ma ndia bu ndi-isi ala ahu anāchi achi ndi biri na Jerusalem: ma n'obodo nile nke Juda ka ndi ọzọ biri, nwoke ọ bula n'ihe-onwunwe-ya n'obodo nile ha, bú Israel, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na Netinim, na umu ndi-orù Solomon. 4 Ma na Jerusalem ka ufọdu nime umu Juda na nime umu Benjamin biri. Site n'umu Juda: Ataia nwa Uzaia, nwa Zekaraia, nwa Amaraia, nwa Shefataia, nwa Mahalalel, site n'umu Perez; 5 na Maaseia nwa Beruk, nwa Kọl-hose, nwa Hazaia, nwa Adaia, nwa Joiarib, nwa Zekaraia, nwa onye Shailo. 6 Umu Perez nile ndi bi na Jerusalem di nnù na ọgu atọ na asatọ, ndikom bu dìnkpà. 7 Ndia bu kwa umu Benjamin: Salu nwa Meshulam, nwa Joed, nwa Pedaia, nwa Kolaia, nwa Maaseia, nwa Itiel, nwa Jeshaia. 8 N'iso ya Gabaia, na Salai, na nnù abua na ọgu isi na asatọ. 9 Joel nwa Zikri bu kwa onye nēlekọta ha: Juda nwa Hasenua bu kwa onye nke-abua n'ichi obodo ahu. 10 Site na ndi-nchu-àjà: Jedaia nwa Joiarib, na Jakin, 11 na Seraia nwa Hilkaia, nwa Meshulam, nwa Zedok, nwa Meraiot, nwa Ahaitub, bú onye-ndú ulo Chineke, 12 na umu-nne-ha ndi nēje ozi ulo ahu, nnù abua na orú na abua: na Adaia nwa Jeroham, nwa Pelalia, nwa Amzi, nwa Zekaraia, nwa Pashua, nwa Malkija, 13 na umu-nne-ya, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna, ọgu iri-na-abua na abua: na Amashsai nwa Azarel, nwa Ahzai, nwa Meshilemot, nwa Imea, 14 na umu-nne-ha, bú ndi-dike bu dìnkpà, ọgu isi na asatọ: onye nēlekọta ha bu Zabdiel nwa Hagedolim. 15 Site kwa na ndi Livai: Shemaia nwa Hashub, nwa Azrikam, nwa Hashabaia, nwa Buni; 16 na Shabetai, na Jozabad, ndi sitere na ndi-isi ndi Livai, ndi bu ndi-isi nke ije-ozi nke èzí diri ulo Chineke; 17 na Matanaia nwa Maika, nwa Zabdi, nwa Esaf, onye bu isi nāmalite ikele ekele n'ekpere, na Bakbukia, bú onye nke-abua n'umu-nne-ya; na Abda nwa Shamua, nwa Galal, nwa Jedutun. 18 Ndi Livai nile n'obodo nsọ ahu di ọgu iri-na-anọ na anọ. 19 Ọzọ, ndi-ọnu-uzọ-ama, bú Akub, na Talmon, na umu-nne-ha, ndi nēche nche n'ọnu-uzọ-ama nile, di ọgu asatọ na iri na abua. 20 Ma ndi fọduru nke Israel, na nke ndi-nchu-àjà, na nke ndi Livai, nọ n'obodo nile nke Juda, nwoke ọ bula n'ihe-nketa-ya. 21 Ma Netinim bi n'Ofel: Ziha na Gishpa bu kwa ndi-isi Netinim. 22 Ma onye-nlekọta ndi Livai nime Jerusalem bu Uzi nwa Bani, nwa Hashabaia, nwa Matanaia, nwa Maika, sitere n'umu Esaf, bú ndi-ọbù-abù, onye nēle ije-ozi nke ulo Chineke anya. 23 N'ihi na ihe eze nyere n'iwu di bayere ha, òkè kwesiri ntukwasi-obi di-kwa-ra ndi-ọbù-abù, ihe nke ubọchi n'ubọchi-ya. 24 Petahia nwa Meshezabel, onye sitere n'umu Zera nwa Juda, nọ kwa n'aka eze, ikwuru ndi-Ju okwu ọ bula. 25 Ma n'obodo ntà nle n'ọhia-ha, ufọdu nime umu Juda biri na Kiriat-aba na umu-obodo-ya, na nime Dibon na umu-obodo-ya, na nime Jekabzeel na obodo ntà ya; 26 na nime Jeshua, na nime Molada, na nime Bet-pelet; 27 na nime Haza-shual, na nime Bia-sheba na umu-obodo-ya; 28 na nime Ziklag, na nime Mekona, na n'umu-obodo-ya; 29 na n'En-rimon, na nime Zora, na nime Jamut; 30 na Zanoa, na Adulam, na obodo ntà ha, na Lekish na ọhia-ya nile, na Azeka na umu-obodo-ya. Ha we ma ulo-ikwū-ha site na Bia-sheba rue ndagwurugwu Hinom. 31 Umu Benjamin bi-kwa-ra site na Geba ga n'iru, nime Mikmash, na Aija, na Bet-el na umu-obodo-ya; 32 na Anatot, na Nob, na Anania; 33 na Hezoa, na Rema, na Gitaim; 34 na Hadid, na Zeboim, na Nebalat; 35 na Lod, na Ono, bú ndagwurugwu ndi-ọ̀kà. 36 Site kwa na ndi Livai òkè ufọdu nke Juda diri Benjamin.

Nehemaia 12

1 Ma ndia bu ndi-nchu-aja na ndi Livai ndi soro Zerubabel nwa Shealtiel, na Jeshua, rigota: Seraia, na Jeremaia, na Ezra; 2 na Amaria, na Maluk, na Hatush; 3 na Shekania, na Rehum, na Meremot; 4 na Ido, na Ginetoi, na Abaija; 5 na Mijamin, na Maadia, na Bilga; 6 na Shemaia, na Joiarib, na Jedaia; 7 na Salu, na Amok, na Hilkaia, na Jedaia. Ndia bu ndi-isi nke ndi-nchu-àjà na umu-nne-ha n'ubọchi Jeshua. 8 Ndi Livai kwa: Jeshua, na Binui, na Kadmiel, na Sherebia, na Juda, na Matanaia, bú onye-isi usu ndi nēkele ekele, ya onwe-ya na umu-nne-ya. 9 Bakbukia na Uno, bú umu-nne-ha, nọ kwa na ncherita-iru ha, dika ihe-ndebe nile ha si di. 10 Jeshua we mua Joiakim, Joiakim mua Elaiashib, Elaiashib mua Joiada, 11 Joiada, mua Jonatan, Jonatan mua Jadua. 12 Ma n'ubọchi Joiakim ndi-nchu-àjà di, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna: nke Seraia, Meraia; nke Jeremaia, Hananaia; 13 nke Ezra, Meshulam; nke Amaraia, Jehohanan; 14 nke Meluki, Jonatan; nke Shebania, Josef; 15 nke Harim, Adna; nke Meraiot, Helkaia; 16 nke Ido, Zekaraia; nke Gineton, Meshulam; 17 nke Abaija, Zikri; nke Miniamin, nke Moadia, Piltai; 18 nke Bilga, Shamua; nke Shemaia, Jehonatan; 19 nke Joiarib kwa, Matenai; nke Jedaia, Uzi; 20 nke Salai, Kalai; nke Amok, Iba; 21 nke Hilkaia, Hashabaia; nke Jedaia, Netanel. 22 Edewo ndi-Livai n'akwukwọ n'ubọchi Elaiashib na Joiada na Johanan na Jadua ibu ndi-isi ulo nke ndi bu nna: ndi-nchu-àjà kwa, n'ọbubu-eze Daraiọs, bú onye Peasia. 23 Edewo umu Livai n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi ahu, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna, we rue ubọchi Johanan nwa Elaiashib. 24 Ndi-isi ndi Livai kwa: Hashabaia, na Sherebia, na Jeshua nwa Kadimiel, na umu-nne-ha ndi nọ na ncherita-iru ha, ito Chineke na ikele ekele, dika ihe Devid, bú onye nke Chineke, nyere n'iwu si di, otù ihe-ndebe nēcherita ihe-ndebe ọzọ iru. 25 Matanaia na Bakbukia na Obadia na Meshulam na Talmon na Akub bu ndi-ọnu-uzọ-ama nēdebe ihe-ndebe-ha n'ulo-nchikọbata-ihe nile nke ọnu-uzọ-ama nile. 26 Ndia nọ n'ubọchi Joiakim nwa Jeshua, nwa Jozadak, na n'ubọchi Nehemaia, bú onye nāchi ala, na nke Ezra, bú onye-nchu-àjà, bú ode-akwukwọ. 27 Ma n'ira mb͕idi Jerusalem nye Chineke ha chọputara ndi Livai n'ebe-ha nile, ime ka ha biarue Jerusalem, ime ememe nke ira mb͕idi Jerusalem nye Chineke, ọbuná n'iṅuri-ọṅu, na n'ikele-ekele, na n'ibù-abù, n'ájà na une na n'ubọ-akwara. 28 Umu nke ndi-ọbù-abù we chikọta onwe-ha, ọbuná site na buruburu-ala nke di Jerusalem buruburu, site kwa n'obodo ntà nile nke ndi Netofa; 29 site kwa na Bet-gilgal, site kwa n'ọhia nile nke Geba na Azmavet: n'ihi na ndi-ọbù-abù wuru obodo ntà nye onwe-ha buruburu Jerusalem. 30 Ndi-nchu-àjà na ndi Livai we me onwe-ha ka ha di ọcha: ha me-kwa-ra ka ndi Israel na ọnu-uzọ-ama nile na mb͕idi di ọcha. 31 M'we me ka ndi-isi Juda rigo n'elu mb͕idi, m'we guzo oké usu abua nke ndi nēkele ekele nēje kwa n'usoro; otù usu we je n'aka-nri n'elu mb͕idi rue ọnu-uzọ-ama nke ebe ikpofu ahihia: 32 Hoshaia we jeso ha, ya na nkera ndi-isi Juda, 33 na Azaraia, na Ezra, na Meshulam, 34 na Juda, na Benjamin, na Shemaia, na Jeremaia, 35 na ufọdu nime umu nke ndi-nchu-àjà, ndi chiri opì: na Zekarai nwa Jonatan, nwa Shemaia, nwa Matanaia, nwa Maikaia, nwa Zakua, nwa Esaf; 36 na umu-nne-ya, bú Shemaia, na Azarel, na Milalai, na Gilalai, na Maai, na Netanel, na Juda, na Hanani, ndi chiri ihe abù nke Devid, bú onye nke Chineke; Ezra, bú ode-akwukwọ, nọ kwa n'iru ha: 37 ha we rigo n'akuku ọnu-uzọ-ama isi-iyi, na ncherita-iru ha kwa, n'elu ihe-nrigo obodo Devid, nime nrigo mb͕idi, site n'akuku di n'elu n'ebe ulo Devid di, we rue ọnu-uzọ-ama miri n'akuku ọwuwa-anyanwu. 38 Usu nke-abua nke ndi nēkele ekele nke nēje izute ha je-kwa-ra, mu onwem so-kwa-ra ha je, mu na nkera ndi-ayi, n'elu mb͕idi, site n'akuku di n'elu n'ebe ulo-elu nke ite-ọku uku di, we rue mb͕idi sara mbara; 39 site kwa n'akuku di n'elu n'ebe ọnu-uzọ-ama Efraim di, na n'akuku ọnu-uzọ-ama ochie, na n'akuku ọnu-uzọ-ama azù, na ulo-elu Hananel, na ulo-elu Hamea, we rue ọnu-uzọ-ama aturu: ha we guzo n'ọnu-uzọ-ama ulo-nche. 40 Usu abua ahu nke ndi nēkele ekele we guzo n'ulo Chineke, ha na mu onwem, nkera ndi nọchiri anya eze nọye-kwa-ram: 41 ndi-nchu-àjà, bú Elaiakim, na Maaseia, na Miniamin, na Maikaia, na Elioenai, na Zekaraia, na Hananaia, guzo-kwa-ra chiri opì; 42 na Maaseia, na Shemaia, na Eleeza, na Uzi, na Jehohanan, na Malkija, na Ilam, na Eza. Ndi-ọbù-abù na Jezrahia, bú onye-nlekọta-ha, we me ka anu olu-ha. 43 Ha we chua àjà uku n'ubọchi ahu, we ṅuria; n'ihi na Chineke mere ka ha ṅuria ọṅu uku; ọzọ kwa, ndinyom-ha na umu-ntakiri-ha ṅuriri: ewe nu ọṅù Jerusalem rue ebe di anya. 44 Ewe me ndikom ufọdu n'ubọchi ahu ka ha buru ndi nēlekọta ime-ulo nile nke idebe àkù, na idebe àjà-nbuli nile, na ibede nkpuru mbu, na idebe otù uzọ n'uzọ iri nile, ichikọbata nime ha, dika ubi obodo nile si di, òkè nile nke iwu nyere ndi-nchu-àjà na ndi Livai: n'ihi na ọṅù Juda di n'ihi ndi-nchu-àjà na n'ihi ndi Livai, bú ndi nēguzo eguzo. 45 Ha we debe ihe-ndebe Chineke-ha, na ihe-ndebe ime-ka-adi-ọcha ahu, ha na ndi-ọbù-abù na ndi-ọnu-uzọ-ama, dika ihe Devid na Solomon nwa-ya nyere n'iwu si di. 46 N'ihi na n'ubọchi Devid na Esaf site na mb͕e ochie onye-isi nke ndi-ọbù-abù di, na abù otuto na ikele-ekele nke anābùku Chineke. 47 Israel nile n'ubọchi Zerubabel, na n'ubọchi Nehemaia, nēnye kwa òkè nke ndi-ọbù-abù na ndi-ọnu-uzọ-ama, ihe nke ubọchi n'ubọchi-ya: ha nēdo-kwa-ra ndi Livai ihe nsọ; ndi Livai nēdo-kwa-ra umu Eron ihe nsọ.

Nehemaia 13

1 N'ubọchi ahu ka ha guru n'akwukwọ Moses na nti ndi Israel; ewe hu ihe edeworo nime ya, bú na onye Amon na onye Moab agaghi-abà na nkpọkọta ndi Chineke rue mb͕e ebighi-ebi; 2 n'ihi na ha ejighi achicha na miri bia n'iru umu Israel, kama ha gotara Belam imegide ha, ikọcha ha: ma Chineke-ayi b͕anwere nkọcha ahu ka ọ ghọ ngọzi. 3 O rue, mb͕e ha nuru iwu ahu, na ha kewapuru ndi nile gwara ọgwa n'Israel. 4 Ma tutu ihe a eme, Elaiashib, bú onye-nchu-àjà, onye edoro onye-isi ime-ulo nke ulo Chineke-ayi, ebe ọ bu ọgọ Tobaia, 5 ọ we doziere ya ime-ulo uku, ma n'ebe ahu ka ha nētiye na mb͕e gara aga onyinye-inata-iru-ọma, na frankincense, na ihe ulo Chineke nile, na otù uzọ n'uzọ iri nke ọka na manya-vine ọhu na manu, bú ihe enyere n'iwu nke ndi Livai na ndi-ọbù-abù na ndi-ọnu-uzọ-ama; na àjà-nbuli nke ndi-nchu-aja. 6 Ma na mb͕e a nile anọghm na Jerusalem; n'ihi na n'arọ nke-orú-na-iri-na-abua nke Atakasakses, bú eze Babilon, ka m'biakutere eze, ma n'ọgwugwu ubọchi ufọdu ariọrọm eze ka ọ rapum: 7 m'we biarue Jerusalem, ghọta ihe ọjọ ahu nke Elaiashib mere bayere Tobaia, n'idoziri ya ime-ulo n'ogige ulo Chineke. 8 O we dim njọ nke-uku: m'we si n'ime-ulo ahu tupu ihe nile nke ulo Tobaia n'èzí. 9 M'we kwue, ha we me ka ime-ulo nile di ọcha: m'we chighachi n'ebe ahu ihe ulo Chineke, ha na onyinye-inata-iru-ọma na frankincense. 10 M'we mata na enyeghi òkè ndi Livai enye; ndi Livai na ndi-ọbù-abù, bú ndi nēje ozi ahu, we b͕alaga, nwoke ọ bula n'ubi-ya. 11 Mu na ndi nọchiri anya eze we se okwu, m'we si, Gini mere arapuworo ulo Chineke? M'we chikọta ha, guzo ha n'ebe-nguzo-ha. 12 Juda nile we webata otù uzọ n'uzọ iri nke ọka na manya-vine ọhu na manu n'ulo-àkù. 13 M'we me ndi-ulo-àkù ndi gāchi ulo-àkù nile, bú Shelemaia onye-nchu-àjà, na Zedok, bú ode-akwukwọ, na Pedaia, onye sitere na ndi Livai: Hanan nwa Zakua, nwa Matanaia, nọ kwa n'akuku ha: n'ihi na aguru ha na ndi kwesiri ntukwasi-obi, ọlu-ha bu kwa ikère umu-nne-ha òkè. 14 Chinekem, chetam n'ihi nka, ehichapu-kwa-la omume-eberem nile nke m'meworo n'ulo Chinekem, na n'ihe-ndebe-ya nile. 15 Na mb͕e ahu ka m'huru nime Juda ufọdu ndi nāzọcha ebe-nzọcha-nkpuru-vine n'ubọchi-izu-ike, ndi nēbubata kwa obo ọka, nēbo kwa inyinya-ibu; ọzọ kwa, manya-vine, na nkpuru-vine, na fig, na ibu nile ọ bula, ha nēbubata kwa ha nime Jerusalem n'ubọchi-izu-ike: m'we b͕a àmà megide ha n'ubọchi ha nēre ihe-oriri. 16 Ndi Taia bi-kwa-ra nime ya, ndi nēwebata azù, na ihe nile ọ bula anēre ere, ha nērenye kwa ha umu Juda n'ubọchi-izu-ike, na nime Jerusalem. 17 Mu na ndi amara aha-ha nime Juda we se okwu, m'we si ha, Gini bu ihe ọjọ a nke unu onwe-unu nēme, nēme kwa ubọchi-izu-ike ka ọ ghara idi nsọ? 18 Ọ̀ bughi otú a ka nna-unu-hà mere, Chineke-ayi we me ka ihe ọjọ a nile biakwasi ayi, biakwasi kwa obodo a? ma unu onwe-unu nātukwasi ihe n'ihe di ọku di n'aru Israel, n'ime ubọchi-izu-ike ka ọ ghara idi nsọ. 19 O rue, mb͕e ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem nāb͕a ọchichiri tutu ubọchi-izu-ike erue, na asirim ka emechie uzọ nile, m'si kwa ka aghara imeghe ha rue mb͕e ubọchi-izu-ike gasiri: m'we guzo ufọdu nime ndi nējerem ozi n'ọnu-uzọ-ama, ka aghara ibubata ibu nime n'ubọchi-izu-ike. 20 Ndi nāzu ahia na ndi nēre ihe ọ bula nke anēre ere we nọ ọnọdu-abali n'azu Jerusalem otù ub͕ò ma-ọbu ub͕ò abua. 21 M'we b͕a àmà megide ha, si ha, Gini mere unu onwe-unu nānọ ọnọdu-abali na ncherita-iru mb͕idi? ọ buru na unu eme ya ọzọ, m'gēseti aka megide unu. Site na mb͕e ahu ha abiaghi n'ubọchi-izu-ike. 22 M'we si ndi Livai ka ha nēme onwe-ha ka ha di ọcha, ka ha nābia kwa nēche ọnu-uzọ-ama nile, ido ubọchi-izu-ike nsọ. Chinekem, cheta-kwa-ram ihe a, me-kwa-ram ebere, dika, iba-uba nke ebere-Gi si di. 23 Ọzọ, na mb͕e ahu ka m'huru ndi-Ju ndi lutara nwunye ndi bu ndinyom Ashdod na ndinyom Amon na ndinyom Moab: 24 umu-ha we nēkwu okwu nkera n'asusu Ashdod, ha amataghi kwa ikwu okwu n'asusu ndi-Ju, kama dika asusu uzọ ndi abua ahu si di. 25 Mu na ha we se okwu, m'we kọcha ha, tie ufọdu nime ha aka, kwopu agiri-isi-ha, me ka ha were Chineke ṅua iyi, si, Unu ewela umu-unu ndinyom nye umu-ha ndikom, unu aluta-kwa-lara umu-unu ndikom, ma-ọbu onwe-unu, umu-ha ndinyom. 26 Ọ̀ bughi n'ihe ndia ka Solomon, bú eze Israel, mehiere? ma n'etiti ọtutu mba ọ dighi eze di ka ya, onye Chineke huru n'anya ka ọ bu kwa, Chineke we me ya eze Israel nile: ọbuná onye ahu ka ndinyom ala ọzọ mere ka o mehie. 27 Ọ̀ bu kwa unu ka ayi gēge nti ime ihe ọjọ uku a nile, imekpu emekpu megide Chineke-ayi n'iluta ndinyom ala ọzọ? 28 Ma otù nime umu-ndikom Joiada nwa Elaiashib, bú onye-isi-nchu-àjà, bu di nwa-nwayi Sanbalat onye Horonaim: m'we me ka ọ b͕apu n'ebe m'nọ. 29 Chinekem, cheta ha, n'ihi na ha emewo ka agua ọlu-nchu-àjà, na ọb͕ub͕a-ndu ọlu-nchu-àjà, na nke ndi Livai, n'ihe nādighi nsọ. 30 Eme-kwa-ram ka ha puta n'ebe onye ala ọzọ ọ bula nọ di ọcha, m'we guzoro ndi-nchu-àjà, guzo-kwa-ra ndi Livai, ihe-ndebe, nwoke ọ bula n'ije-ozi-ya; 31 na inara onyinye iji biaru nso, bú nkú, na mb͕e ezubere, na inara nkpuru mbu. Chinekem, chetam, imerem ezi ihe.

Esta 1

1 O rue, n'ubọchi Ahasuerọs, (nka bu Ahasuerọs nke bu eze ọgu ala anāchi achi na asa, site n'India we rue Etiopia: ) 2 na mb͕e ahu, mb͕e eze, bú Ahasuerọs, nọkwasiri n'oche-eze ala-eze-ya, nke di na Shushan, bú ulo uku eze, 3 n'arọ nke-atọ nke ọbubu-eze-ya, na o mere ọṅuṅu-manya-vine nye ndi-isi-ya na ndi-orù-ya; ndi bu dìnkpà nke Peasia na Midia, bú ndi-eze na ndi-isi nke ala nile anāchi achi, nọ n'iru ya: 4 mb͕e o mere ka ahú àkù nke nsọpuru ala-eze-ya na ọkaka nke ima-nma nke idi-uku-ya ọtutu ubọchi, bú ọgu ubọchi iteghete. 5 Ma mb͕e emezuru ubọchi ndia, eze mere ọṅuṅu-manya-vine nye ndi nile ndi ahuru na Shushan, bú ulo uku eze, site n'onye uku we rue onye ntà, ubọchi asa, n'ogige nke ubi ab͕ara ogige nke ulo eze; 6 ihe-nkwuba di nke ezi ákwà ọcha na ogho ọcha na ogho anunu, nke eji udọ̀ nke ezi ákwà ọcha na ogho ododo kekọta ha na nb͕a-aka ọla-ọcha na ogidi marble: ihe-ndina bu ọla-edo na ọla-ọcha, n'elu pavement eji marble uhie, na nke ọcha, na nke edo, na nke oji, me. 7 Ha me-kwa-ra ka ha ṅua ihe-ọṅuṅu n'ihe ọla-edo, (ihe nile di kwa iche iche, ) manya-vine nke ala-eze ba-kwa-ra uba, dika aka eze ruru. 8 Ọṅuṅu-ihe ahu di ka iwu si di; ọ dighi onye nērugide erugide: n'ihi na otú a ka eze nyere onye uku ọ bula nke ulo-ya iwu, ime dika ọ tọrọ nwoke ọ bula utọ. 9 Vashti, bú nwunye eze, me-kwa-ra ọṅuṅu-manya-vine nye ndinyom n'ulo ala-eze nke eze, bú Ahasuerọs, nwere. 10 N'ubọchi nke-asa, mb͕e obi eze di nma site na manya-vine, ọ siri Mehuman, na Bizta, na Habona, na Bigta, na Abagta, na Zeta, na Kakas, bú ndi-onozi asa ndi nēje ozi n'iru eze, bú Ahasuerọs, 11 ka ha me ka Vashti, bú nwunye eze, bia n'iru eze nēkpu okpu-eze nke ala-eze, ime ka ndi di iche iche na ndi-isi hu nma-ya: n'ihi na nwayi nke di nma ile anya ka ọ bu. 12 Nwunye eze, bú Vashti, we ju ibia n'okwu eze nke sitere n'aka ndi-onozi: eze we we iwe nke-uku, ọnuma-ya nēre ọku nime ya. 13 Eze we si ndi mara ihe, bú ndi mara mb͕e di iche iche, (n'ihi na otú a ka okwu eze di n'iru ndi nile mara iwu na ikpé; 14 ma onye nọ nso ya bu Kashena, ya na Sheta, na Admata, na Tashish, na Meres, na Masena, na Memukan, bú ndi-isi asa nke Peasia na Midia, ndi nāhu iru eze, ndi nānọ n'isi n'ala-eze: ) 15 Dika iwu si di, gini ka agēme nwunye eze, bú Vashti, n'ihi na o meghi ihe eze, bú Ahasuerọs, siri ya site n'aka ndi-onozi? 16 Memukan we kwue n'iru eze na ndi-isi, si, Ọ bughi eze, nání ya, ka Vashti, bú nwunye eze, mere ajọ omume megide, kama megide ndi-isi nile, megide kwa ndi di iche iche nile ndi nọ n'ala nile anāchi achi nke eze, bú Ahasuerọs. 17 N'ihi na okwu a bayere nwunye eze gāpu rue nti ndinyom nile, ime ka di-ha buru ihe anēleda eleda n'anya-ha, mb͕e ha nāsi, Eze, bú Ahasuerọs, siri ka eme Vashti, bú nwunye eze, ka ọ bia n'iru ya, ma ọ biaghi. 18 Ubọchi ta ka ndinyom ndi-isi nke Peasia na Midia, bú ndi nuworo okwu a bayere nwunye eze, gāsi kwa ndi-isi nile nke eze otú a, nleda-anya na iwe nke zuru ezu gāputa kwa. 19 Ọ buru na ọ di eze nma, ka okwu ala-eze si n'iru ya pua, ka ede kwa ya n'akwukwọ n'etiti iwu Peasia na Media, o we ghara igabiga, ka Vashti ghara ibia ọzọ n'iru eze, bú Ahasuerọs; ka eze nye kwa nwayi-ibe-ya nke ka ya nma ọnọdu-nwunye-eze-ya. 20 Agēme kwa ka anu iwu eze, bú nke ọ nēme, n'ala-eze-ya nile, (n'ihi na ihe bara uba ka ọ bu, ) ndinyom nile gēnye di-ha nsọpuru, site n'onye uku we rue onye ntà. 21 Okwu ahu we di nma n'anya eze na ndi-isi-ya; eze we me dika okwu Memukan si di: 22 o we ziga akwukwọ n'ala nile anāchi achi nke eze, n'ala ọ bula anāchi achi dika odide-akwukwọ-ya si di, ziga-kwa-ra ndi ọ bula dika asusu-ya si di, na nwoke ọ bula gābu onye-isi n'ulo-ya, na ọ ganēkwu kwa ya dika asusu ndi-ya si di.

Esta 2

1 Mb͕e ihe ndia gasiri, mb͕e ọnuma eze, bú Ahasuerọs, bìri, ọ chetara Vashti, na ihe o mere, na ihe ekwubìri megide ya. 2 Ndi-ozi eze, bú ndi nējere ya ozi, we si ya, Ka ha chọrọ eze umu-ab͕ọghọ ndi nāmaghi nwoke, bú ndi di nma ile anya: 3 ka eze me kwa ndi-nlekọta n'ala nile anāchi achi nke ala-eze-ya, ka ha we chikọta umu-ab͕ọghọ nile ndi nāmaghi nwoke, bú ndi di nma ile anya, rue Shushan, bú ulo uku eze, rue ulo ndinyom, rue aka Hege, bú onozi eze, onye nēdebe ndinyom; ka enye kwa ha ihe-nsacha nile ha: 4 ka nwa-ab͕ọghọ nke di nma n'anya eze buru nwunye eze n'ọnọdu Vashti. Ihe ahu we di nma n'anya eze; o we me otú a. 5 Otù nwoke, bú onye-Ju, nọ na Shushan, bú ulo uku eze, aha-ya bu Mọdekai, nwa Jaia, nwa Shimai, nwa Kish, bú onye Benjamin; 6 onye emere ka o si na Jerusalem je biri n'ala ọzọ n'etiti ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, bú ndi emere ha na Jekonaia, bú eze Juda, ka ha je biri n'ala ọzọ, onye Nebukadneza, bú eze Babilon, mere ka ọ je biri n'ala ọzọ. 7 O we nāzùlite Hadasa, nke ahu bu Esta, nwa-nwayi nwa-nne nna-ya: n'ihi na o nweghi nna ma-ọbu nne, ma nwa-ab͕ọghọ ahu mara nma n'aru, di kwa nma ile anya; mb͕e nna-ya na nne-ya nwuru, Mọdekai we kuru ya onwe-ya ka ọ buru nwa-ya nwayi. 8 O rue, mb͕e anuru okwu eze na iwu-ya, mb͕e achikọbata-kwa-ra ọtutu umu-ab͕ọghọ nime Shushan, bú ulo uku eze, rue aka Hegai, na ekubatara Esta n'ulo eze, rue aka Hegai, onye nēdebe ndinyom. 9 Nwa-ab͕ọghọ ahu we di nma n'anya-ya, ewe mere ya ebere n'iru ya; o we me ngwa inye ya ihe-nsacha-ya nile, na òkè-ya nile, na umu-ab͕ọghọ asa ahu ndi eleputaworo n'ulo eze ka enye ya ha: o we wegharia ya na umu-ab͕ọghọ-ya n'ulo kachasi nma nke ndinyom. 10 Esta egosighi ndi-ya ma-ọbu umu-nna-ya: n'ihi na Mọdekai nyere ya iwu ka ọ ghara igosi ha. 11 Mọdekai we nējeghari n'iru ogige ulo ndinyom n'ubọchi nile ọ bula, imara udo Esta, na ihe agēme ya. 12 Ma mb͕e orúrú nwa-ab͕ọghọ ọ bula biaruru nso ibakuru eze, bú Ahasuerọs, mb͕e ọnwa iri na abua gwusiri ya, dika iwu ndinyom si di, (n'ihi na otú a ka anēmezu ubọchi nsacha-ha, bú ọnwa isi iji manu myrrh, na ọnwa isi iji uda di iche iche na iji ihe-nsacha ndinyom, ) 13 nwa-ab͕ọghọ ahu we biakute eze n'uzọ di otú a, anēnye ya ihe ọ bula ọ nāsi ha nye, iso ya si n'ulo ndinyom biarue ulo eze. 14 N'anyasi ka nwayi ahu batara, n'ututu ka nwayi ahu laghachi-kwa-ra n'ulo nke-abua nke ndinyom, rue aka Shaashgaz, bú onozi eze, onye nēdebe ndi-iko-nwayi: ọ dighi-abiakute eze ọzọ, ma-ọbughi na ihe-ya tọrọ eze utọ, ewe kpọ ya n'aha. 15 Ma mb͕e orúrú Esta, bú nwa-nwayi Abihail nwa-nne nna Mọdekai, onye kuru ya n'onwe-ya ka ọ buru nwa-ya nwayi, biaruru ibakuru eze, ọ chọghi ihe, ọ bu nání ihe Hegai, bú onozi eze, onye nēdebe ndinyom, nāsi ya. Esta we nānata amara n'anya ndi nile nāhu ya anya. 16 Ewe kuru Esta jekuru eze, bú Ahasuerọs, rue ulo ala-eze ya, n'ọnwa nke-iri, nke ahu bu ọnwa Tebet, n'arọ nke-asa nke ọbubu-eze-ya. 17 Eze we hu Esta n'anya kari ndinyom ahu nile, o we nata amara na ebere n'iru ya kari umu-ab͕ọghọ ahu nile ndi nāmaghi nwoke; o we tukwasi okpu-eze ala-eze n'isi-ya, me ya nwunye eze n'ọnọdu Vashti. 18 Eze we mere ndi-isi-ya na ndi-orù-ya nile oké ọṅuṅu-manya-vine, bú ọṅuṅu-manya-vine, Esta; o me-kwa-ra ka ala nile anāchi achi zuru ike n'itu utu, o we nye onyinye, dika aka eze ruru. 19 Ma mb͕e achikọtara ha nke ub͕ò abua, bú umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, Mọdekai we nānọdu n'ọnu-uzọ-ama eze. 20 Esta adighi-egosi umu-nna-ya ma-ọbu ndi-ya; dika Mọdekai nyere ya iwu: n'ihi na ihe Mọdekai siri, nke ahu ka Esta nēme, dika mb͕e anāzùlite ya n'aka-ya. 21 Na mb͕e ahu, mb͕e Mọdekai nānọdu n'ọnu-uzọ-ama eze, Bigtan na Teresh, bú ndi-nchedo abua nke eze, nime ndi nēche nbata-uzọ, were iwe, chọ iseti aka megide eze, bú Ahasuerọs. 22 Mọdekai we mata ihe ahu, o we gosi Esta, bú nwunye eze; Esta we gwa eze n'aha Mọdekai. 23 Ewe jua ase okwu ahu, chọputa ya, ewe kwuba ha abua n'osisi: ewe de ya n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi ahu n'iru eze.

Esta 3

1 Mb͕e ihe ndia gasiri, eze, bú Ahasuerọs, mere Heman nwa Hamedata, bú onye Egag, ka ọ buru onye oku, o we bulie ya elu, do oche-eze-ya n'ebe di elu kari ndi-isi nile ya na ha nọ. 2 Ndi-orù nile nke eze, ndi nọ n'ọnu-uzọ-ama eze, we nēruru ala, nākpọ kwa isi ala nye Heman: n'ihi na otú a ka eze nyere iwu bayere ya. Ma Mọdekai adighi-eruru ala, ọ dighi-akpọ kwa isi ala nye ya. 3 Ndi-orù eze, ndi nọ n'ọnu-uzọ-ama eze, we si Mọdekai, Gini mere gi onwe-gi nāgabiga ihe eze nyere n'iwu? 4 O rue, mb͕e ha nāgwa ya okwu kwa-ubọchi, ma ọ geghi nti ha, na ha gosiri Heman, ihu ma okwu Mọdekai gēguzo: n'ihi na o gosiri ha na ya onwe-ya bu onye-Ju. 5 Heman we hu na Mọdekai adighi-eruru ala, na ọ dighi-akpọ kwa isi ala nye ya, Heman we juputa n'ọnuma. 6 O we buru ihe-nleda-anya n'anya-ya iseti aka megide Mọdekai, nání ya; n'ihi na ha gosiri ya ndi Mọdekai: Heman we chọ ikpochapu ndi-Ju nile ndi nọ n'ala-eze nile nke Ahasuerọs, bú ndi Mọdekai. 7 N'ọnwa mbu, nke ahu bu ọnwa Nisan, n'arọ nke-iri-na-abua nke eze, bú Ahasuerọs, ka ha fere Pua, nke ahu bu nzà, n'iru Heman, site n'otù ubọchi rue ubọchi ọzọ, site kwa n'otù ọnwa ọzọ, rue ọnwa nke-iri-na-abua, nke ahu bu ọnwa Ada. 8 Heman we si eze, bú Ahasuerọs, Otù ndi di ndi emeworo ka ha b͕asa, ndi ekesawo-kwa-ra ha n'etiti ndi di iche iche n'ala nile anāchi achi nke ala-eze-gi; iwu nile ha di kwa iche n'iwu ndi ọ bula; ha adighi-edebe kwa iwu nile nke eze: o kwesighi kwa eze ka o kwe ka ha nọduru onwe-ha. 9 Ọ buru na ọ di eze nma, ka ede ya n'akwukwọ ime ka ha la n'iyì: m'gātù kwa orú nnù talent ọla-ọcha na nnù ise nye n'aka ndi nēje ozi a, iwebata ya n'ulo-àkù eze. 10 Eze we si n'aka-ya wezuga nb͕a-aka-akàrà-ya nye ya Heman nwa Hamedata onye Egag, bú onye nākpab͕u ndi-Ju. 11 Eze we si Heman, Enyewo gi ọla-ọcha, ya na ndi ahu, ime ha dika ihe ahu si di nke di nma n'anya-gi. 12 Ewe kpọ ndi-ode-akwukwọ eze n'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-atọ di nime ya, ewe de ya n'akwukwọ dika ihe nile si di nke Heman nyere ndi nọchiri anya eze n'iwu, nke o nye-kwa-ra ndi nāchi ala ndi bu ndi-isi ala ọ bula anāchi achi, nke o nye-kwa-ra ndi-isi ndi ọ bula; ala ọ bula anāchi achi dika odide-akwukwọ-ya si di, na ndi ọ bula dika asusu-ya si di; n'aha eze, bú Ahasuerọs, ka edere ya, eji-kwa-ra nb͕a-aka-akàrà eze ka ya akàrà. 13 Ewe site n'aka ndi-ọb͕a-ọsọ ziga akwukwọ n'ala nile anāchi achi nke eze, ikpochapu, na ib͕u, na ime ka ndi-Ju nile la n'iyì, site na nwata we rue okenye, ma umu-ntakiri ma ndinyom, n'otù ubọchi, n'ubọchi nke-iri-na-atọ nke ọnwa nke-iri-na-abua, nke ahu bu ọnwa Ada, na iluta ihe-nkwata-ha n'agha. 14 Ndeputa odide-akwukwọ ahu, nke agēnye dika iwu n'ala nile ọ bula anāchi achi, ekpughere ya nye ndi nile di iche iche, ka ha nọ na njikere bayere ubọchi a. 15 Ndi-ọb͕a-ọsọ puru, ebe ewere okwu eze me ka ha me ngwa, enye-kwa-ra iwu ahu nime Shushan, bú ulo uku eze: ma eze na Heman nọduru iṅu ihe-ọṅuṅu; ma ọ b͕ara obodo ahu, bú Shushan, ghari.

Esta 4

1 Ma Mọdekai mara ihe nile emere, Mọdekai we dọwa uwe-ya nile, yikwasi ákwà-nkpe, kpokwasi ntu n'aru-ya, pua je n'etiti obodo, tie oké nkpu di ilu: 2 o we bia rue n'iru ọnu-uzọ-ama eze: n'ihi na ọ dighi onye gābà n'ọnu-uzọ-ama eze n'uwe nke ákwà-nkpe. 3 Ọzọ, n'ala nile ọ bula anāchi achi, ebe ọ bula okwu eze na iwu-ya nābiaru, oké iru-újú ndi-Ju, na obubu-ọnu, na ikwa-ákwá, na iti-aka-n'obi; atusa-kwa-ra ákwà-nkpe na ntu n'okpuru ọtutu madu. 4 Umu-ab͕ọghọ Esta na ndi-onozi-ya we bia gosi ya; o we nēb͕u nwunye eze ahu nb͕u n'obi nke-uku; o we zìe uwe iyikwasi Mọdekai, na iwezuga ákwà-nkpe-ya n'aru-ya: ma ọ naraghi ha. 5 Esta we kpọ Hatak, bú otù onye nime ndi-onozi eze, onye eze mere ka o guzo n'iru ya, o we nye ya iwu ijekuru Mọdekai, imara ihe nka bu, na ihe kpatara nka. 6 Hatak we pukuru Mọdekai rue amá obodo ahu, nke di n'iru ọnu-uzọ-ama eze. 7 Mọdekai we gosi ya ihe nile mere ya, kọ-kwa-ra ya isi ego ahu nke Heman siri na ọ gātù nye n'ulo-àkù eze n'ihi ndi-Ju, ime ka ha la n'iyì. 8 Ọzọ, ndeputa odide-akwukwọ iwu ahu nke enyere nime Shushan ikpochapu ha, o nyere ya ya, ime ka Esta hu ya, na igosi ya; na inye ya iwu ibakuru eze, iriọ ya aririọ-amara, na ichọrọ ndi-ya ihe n'iru ya. 9 Hatak we bia gosi Esta okwu Mọdekai nile. 10 Esta we gwa Hatak okwu, nye ya iwu inye Mọdekai, si: 11 Ndi-orù nile nke eze, na ndi ala anāchi achi nke eze, mara, na nwoke ọ bula, ma-ọbu nwayi ọ bula, nke gābakuru eze, rue ogige di ime-ime, bú onye anākpọghi, otù iwu-ya bu ka eme ka ha nwua, nāgughi onye eze nēsetiri nkpa-n'aka ọla-edo, ka ọ di ndu: ma akpọghi mu onwem ibakuru eze orú ubọchi na iri ndia. 12 Ha we gosi Mọdekai okwu Esta nile. 13 Mọdekai we si ha zaghachi Esta, si, Ekwula na nkpuru-obi-gi na i gēwepuga onwe-gi n'ulo eze, kari ndi-Ju nile. 14 N'ihi na ọ buru na i b͕a nkiti ghara ikwu okwu ọ bula na mb͕e a, oghere na nnaputa gēguzoro ndi-Ju site n'ebe ọzọ, ma agēme ka gi onwe-gi na ulo nna-gi la n'iyì: ma ònye mara ma ọ bu n'ihi mb͕e di otú a ka i biaruru ala-eze? 15 Esta we si ha zaghachi Mọdekai okwu, si, 16 Je, chikọta ndi-Ju nile ndi aganāchọta nime Shushan, nēbu-kwa-ranum ọnu, unu eri-kwa-la ihe, aṅu-kwa-la ihe-ọṅuṅu ubọchi atọ, abali na ehihie: mu onwem na umu-ab͕ọghọm gēbu kwa ọnu otú a; ma n'uzọ di otú a ka m'gābakuru eze, nke nādighi ka iwu si di: ma asi na alawom n'iyì, alawom n'iyì. 17 Mọdekai we gabiga, me dika ihe nile si di nke Esta nyere ya n'iwu.

Esta 5

1 O rue, n'ubọchi nke-atọ, na Esta yiri uwe ala-eze ya, we guzo n'ogige di ime-ime nke ulo eze, na ncherita-iru ulo eze: ma eze nānọkwasi n'oche-eze ala-eze ya n'ulo ala-eze ya, na ncherita-iru ọnu-uzọ ulo ahu. 2 O rue, mb͕e eze huru Esta, bú nwunye eze, ka o nēguzo n'ogige, na ọ natara amara n'anya-ya: eze we setipuru Esta nkpa-n'aka ọla-edo nke di n'aka-ya. Esta we biarue nso, metu isi nkpa-n'aka ahu. 3 Eze we si ya, Gini ka i nāchọ, Esta, nwunye eze? gini bu kwa ọchichọ-gi? rue nkera ala-eze ka agēnye kwa gi. 4 Esta we si, Ọ buru na ọ di eze nma, ka eze na Heman bia ta n'ọṅuṅu-manya-vine ahu nke m'meworo ya. 5 Eze we si, Menu ka Heman me ngwa ime ihe Esta kwuru. Eze na Heman we bia n'ọṅuṅu-manya-vine nke Esta mere. 6 Eze we si Esta n'ọṅuṅu manya-vine ahu, Gini bu aririọ-gi? agēnye kwa gi ya: gini bu kwa ọchichọ-gi? rue nkera ala-eze ka agēme ya. 7 Esta we za, si, Aririọm na ọchichọm bu; 8 ọ buru na ahutawom amara n'iru eze, ọ buru kwa na ọ di eze nma inye ihe m'nāriọ, na ime ihe m'nāchọ, ka eze na Heman bia n'ọṅuṅu-manya-vine nke m'gēmere ha, echi ka m'gēme kwa dika okwu eze si di. 9 Heman we pua ubọchi ahu nāṅuri ọṅu, ọ di kwa ya nma n'obi: ma mb͕e Heman huru Mọdekai n'ọnu-uzọ-ama eze, na o bilighi, na ọ maghi kwa jijiji n'iru ya, Heman juputara n'ọnuma megide Mọdekai. 10 Ma Heman jisiri onwe-ya ike, ba n'ulo-ya; o we ziga, me ka ndi nāhu ya n'anya bia, ha na Zeresh, bú nwunye-ya. 11 Heman we kọrọ ha akukọ bayere nsọpuru nke àkù-ya, na iba-uba nke umu-ya ndikom, na ihe nile nke eze ji me ka ọ di uku, nke o ji buli kwa ya ibu onye-isi nke ndi-isi na ndi-orù eze. 12 Heman we si, Ọzọ, Esta, bú nwunye eze, emeghi onye ọ bula ka o so eze bata n'ọṅuṅu-manya-vine nke o mere, ọ bu nání mu onwem; ọzọ kwa, echi ka akpọworo mu onwem jekuru ya, mu na eze. 13 Ma ihe a nile adighi-ezurum, na mb͕e nile mu onwem nāhu Mọdekai, bú onye-Ju, ka ọ nānọdu n'ọnu-uzọ-ama eze. 14 Zeresh, bú nwunye-ya, na ndi nile nāhu ya n'anya, we si ya, Ka ha me osisi nke idi-elu-ya di ọgu cubit abua na iri, ma n'ututu gi si eze ka akwuba Mọdekai n'elu-ya: gi so kwa eze ba n'ọṅuṅu-manya-vine ahu nāṅuri ọṅu. Okwu ahu we di nma n'anya Heman; o we me osisi ahu.

Esta 6

1 N'abali ahu urá eze fepuru n'anya-ya; o we si ka ewebata akwukwọ ihe-ncheta nke ihe emere n'ubọchi ahu, ewe nāgu ha n'iru eze. 2 Ewe hu ihe a nke edere n'akwukwọ, bú na Mọdekai gosiri ihe bayere Bignata na Teresh, bú ndi-onozi abua nke eze, nime ndi nēche ngata-uzọ, ndi chọrọ iseti aka megide eze, bú Ahasuerọs. 3 Eze we si, Nsọpuru na idi-uku gini ka emere Mọdekai n'ihi ihe a? Ndi-ozi eze, bú ndi nējere ya ozi, we si, Ọ dighi ihe emere ya. 4 Eze we si, Ònye nọ n'ogige? Ma Heman abatawo n'ogige ulo eze nke di n'èzí, isi eze ka ọ kwuba Mọdekai n'osisi nke o doziri nye ya. 5 Ndi nējere eze ozi we si ya, Le, Heman nēguzo n'ogige. Eze we si, Ya bata. 6 Heman we bata. Eze we si ya, Gini ka agēme nwoke ahu, bú onye nsọpuru-ya tọworo eze utọ? Heman we si n'obi-ya, Ònye ka ọ nātọ eze utọ inye nsọpuru karim? 7 Heman we si eze, Nwoke ahu nke nsọpuru-ya tọworo eze utọ, 8 ka achita uwe ala-eze nke eze yiriworo, na inyinya nke eze nọkwasiworo, na okpu-eze nke ala-eze nke ekpukwasiworo ya n'isi: 9 ka enye kwa uwe ahu na inyinya ahu n'aka otù nwoke nime ndi-isi eze, ndi bu eze, ka ha yikwasi kwa nwoke ahu nke nsọpuru-ya tọworo eze utọ, ka ha me kwa ka inyinya būru ya ga n'amá obodo, ka ha kpọ kwa n'iru ya, si, Otú a ka agēmere nwoke ahu nke nsọpuru-ya tọworo eze utọ. 10 Eze we si Heman, Me ngwa, chiri uwe ahu na inyinya ahu, dika i si kwu, me-kwa-ra Mọdekai otú a, bú onye-Ju, nke nānọdu n'ọnu-uzọ-ama eze: ka okwu ọ bula ghara idapu n'ihe nile nke i kwuworo. 11 Heman we chiri uwe ahu na inyinya ahu, yikwasi Mọdekai, me ka inyinya būru ya ga n'amá obodo, ọ kpọ-kwa-ra n'iru ya, si, Otú a ka agēmere nwoke ahu nke nsọpuru-ya tọworo eze utọ. 12 Mọdekai we laghachi n'ọnu-uzọ-ama eze. Ma Heman were ngwa la n'ulo-ya, nēru újú, ekpuchi-kwa-ra isi-ya. 13 Heman we kọrọ Zeresh, bú nwunye-ya, kọ-kwa-ra ndi nile nāhu ya n'anya, ihe nile nke mere ya. Ndi-ya mara ihe na Zeresh, bú nwunye-ya, we si ya, Ọ buru na Mọdekai sitere na nkpuru ndi-Ju, bú onye i maliteworo ida n'iru ya, i gaghi-enwe ike imegide ya, kama i ghaghi ida n'iru ya. 14 Mb͕e ha na ya nọ nēkwurita okwu, ndi-onozí eze biaruru nso, we me ngwa ime ka Heman bata n'ọṅuṅu-manya-vine nke Esta mere.

Esta 7

1 Eze na Heman we bata iso Esta, bú nwunye eze, ṅu manya-vine. 2 Eze we si kwa Esta n'ubọchi nke-abua, n'ọṅuṅu manya-vine ahu, Gini bu aririọ-gi, Esta, nwunye eze? agēnye kwa gi ya: gini bu kwa ọchichọ-gi? rue nkera ala-eze ka agēme kwa ya. 3 Esta, bú nwunye eze we za, si, Ọ buru na ahutawom amara n'iru gi, eze, ọ buru kwa na ọ di eze nma, ka enyem ndum n'aririọm, na ndim n'ọchichọm: 4 n'ihi na erewo ayi, bú mu onwem na ndim, ikpochapu ayi, na ib͕u ayi, na ime ka ayi la n'iyì. Ma asi na erewo ayi ibu ndi-orù-ndikom na ibu ndinyom nēje ozi, m'gāb͕a nkiti, ọ bu ezie na onye-nkpab͕u agaghi-emezu n'ihe gēfunari eze. 5 Eze, bú Ahasuerọs, we za, si Esta, bú nwunye eze, Ònye ka ọ bu, bú onye a? òle ebe onye a nọ kwa, bú onye ahu nke obi-ya mere ka o zue ime otú a? 6 Esta we si, Otù onye-nkpab͕u na onye-iro, bú Heman ọjọ a. Heman we tua egwu nke-uku n'iru eze na nwunye eze. 7 Eze we si n'ọṅuṅu manya-vine bilie n'ọnuma-ya je n'ubi ab͕ara ogige nke ulo-ya: ma Heman guzoro ichọ ndu-ya n'aka Esta, bú nwunye eze; n'ihi na ọ huru na eze zubesiri ihe ọjọ ike megide ya. 8 Eze we si n'ubi ab͕ara ogige nke ulo-ya biaghachi n'ulo ọṅuṅu manya-vine ahu; ma Heman adawo n'elu ihe-ndina nke Esta nọ n'elu ya. Eze we si, Ọ̀ gēweda kwa nwunye eze n'ala n'irum n'ulom? Mb͕e okwu ahu putara n'ọnu eze, ha kpuchiri iru Heman. 9 Habona, bú otù onye nime ndi-onozi ndi nọ n'iru eze, we si, Le kwa, osisi ahu nke idi-elu-ya di ọgu cubit abua na iri, nke Heman mere nye Mọdekai, bú onye kwuru ezi ihe bayere eze, o nēguzo n'ulo Heman. Eze we si, Kwubanu ya n'elu ya. 10 Ha we kwuba Heman n'elu osisi nke o doziri nye Mọdekai. Ewe me ka ọnuma eze bìe.

Esta 8

1 N'ubọchi ahu eze, bú Ahasuerọs, nyere Esta, bú nwunye eze, ulo Heman, bú onye nākpab͕u ndi-Ju. Ma Mọdekai biara n'iru eze; n'ihi na Esta gosiri ka ya na ya si di. 2 Eze we wezuga nb͕a-aka-ya, nke o mere ka ọ ghara idi n'aka Heman, o we nye ya Mọdekai. Esta we do Mọdekai onye-isi ulo Heman. 3 Esta we kwu kwa ọzọ n'iru eze, da n'ala n'iru ukwu-ya abua, kwa ákwá, riọ ya aririọ-amara, bú ka o me ka ihe ọjọ Heman, bú onye Egag, na èchìchè-ya nke o chère megide ndi-Ju gabiga. 4 Eze we setipuru Esta nkpa-n'aka ọla-edo ya. Esta we bilie, guzo n'iru eze, 5 si, Ọ buru na ọ di eze nma, ọ buru kwa na ahutawom amara n'iru ya, ọ buru kwa na okwu a ziri ezi n'iru eze, ọ buru kwa na mu onwem adi nma n'anya-ya, ka ede ya n'akwukwọ iweghachi akwukwọ, bú èchìchè Heman nwa Hamedata onye Egag, nke o dere ime ka ndi-Ju la n'iyì, bú ndi nọ n'ala nile anāchi achi nke eze. 6 N'ihi na #m'gēsi aṅa pu inagide ya mb͕e m'huru ihe ọjọ nke nābiakwasi ndim? #m'gēsi kwa aṅa pu inagide ya mb͕e m'huru ila-n'iyì umu-nnam? 7 Eze, bú Ahasuerọs, we si Esta, bú nwunye eze, si kwa Mọdekai, bú onye-Ju, Le, ulo Heman ka m'nyere Esta, nwoke ahu ka ha kwuba-kwa-ra n'elu osisi, n'ihi na o setiri aka-ya megide ndi-Ju. 8 Unu onwe-unu kwa, denu akwukwọ bayere ndi-Ju, dika o si di nma n'anya-unu, n'aha eze, were-kwa-nu nb͕a-aka-akàrà eze kà ya: n'ihi na odide-akwukwọ nke edeworo n'aha eze, nke ewerewo-kwa-ra nb͕a-aka-akàrà eze kà ya, ọ dighi onye puru ichighari ya. 9 Ewe kpọ ndi-ode-akwukwọ eze na mb͕e ahu, n'ọnwa nke-atọ, nke ahu bu ọnwa Sivan, n'ubọchi nke-orú-na-atọ nime ya; ewe de ya dika iwu nile si di nke Mọdekai nyere ndi-Ju, nye kwa ndi nọchiri anya eze na ndi nāchi ala na ndi-isi ala nile anāchi achi nke di site n'India we rue Etiopia, bú ọgu ala isi na asa nke anāchi achi, ala ọ bula anāchi achi dika odide-akwukwọ-ya si di, na ndi ọ bula dika asusu-ya si di, nye kwa ndi-Ju dika odide-akwukwọ-ha si di, na dika asusu-ha si di. 10 O we de akwukwọ n'aha eze, bú Ahasuerọs, were nb͕a-aka-akàrà eze kà ya, zìga akwukwọ n'aka ndi-ọb͕a-ọsọ ndi inyinya nēbu, bú ndi inyinya ukwu ọsọ na inyinya mule na umu-inyinya nēbu: 11 bú akwukwọ nke eze kwere nime ha ka ndi-Ju ndi nọ n'obodo nile ọ bula kpọkọta onwe-ha, guzo kwa n'ihi ndu-ha, ikpochapu, na ib͕u, na ime ka ha la n'iyì, bú usu-ndi-agha nile nke ndi ahu na ala ahu anāchi achi ndi nākpab͕u ha, ma umu-ntakiri-ha, ma ndinyom-ha, na iluta ihe-nkwata-ha n'agha, 12 n'ala nile anāchi achi nke eze, bú Ahasuerọs, n'otù ubọchi, bú n'ubọchi nke-iri-na-atọ nke ọnwa nke-iri-na-abua, nke ahu bu ọnwa Ada. 13 Ndeputa odide-akwukwọ, nke agēnye dika iwu n'ala nile ọ bula anāchi achi, ekpughere ya nye ndi nile di iche iche, ka ndi-Ju nọ na njikere bayere ubọchi a, ibọrọ onwe-ha ọ́bọ̀ n'iru ndi-iro-ha. 14 Ndi-ọb͕a-ọsọ ndi inyinya ukwu ọsọ na inyinya mule nēbu puru, ebe ewere okwu eze kwalie ha, me ka ha me ngwa; enye-kwa-ra iwu ahu nime Shushan, bú ulo uku eze. 15 Mọdekai we si n'iru eze pua n'uwe ala-eze nke ákwà anunu na ezi ákwà ọcha, ya na okpu-eze ọla-edo di uku, na uwe-nwuda nke ezi ákwà ọcha na ákwà ododo: obodo Shushan we tie nkpu ṅuri kwa ọṅu. 16 Ndi-Ju nwere ìhè, na ọṅù, na obi-utọ na nsọpuru. 17 N'ala nile ọ bula anāchi achi, na n'obodo nile o bula, ebe ọ bula okwu eze na iwu-ya nābiaru, ndi-Ju nwe-kwa-ra ọṅù na obi-utọ na ọṅuṅu-manya-vine na ezi ubọchi. Ọtutu madu nime ndi di iche iche nke ala ahu we nāghọ ndi-Ju; n'ihi na oké egwu ndi-Ju dakwasiri ha.

Esta 9

1 Ma n'ọnwa nke-iri-na-abua, nke ahu bu ọnwa Ada, n'ubọchi nke-iri-na-atọ nime ya, mb͕e okwu eze na iwu-ya biaruru nso ka eme ya, n'ubọchi mb͕e ndi-iro ndi-Ju lere anya ibu ndi-isi-ha; ma ab͕anwere ya, ndi-Ju onwe-ha we ghọ ndi-isi nke ndi nākpọ ha asì; 2 ndi-Ju kpọkọtara onwe-ha n'obodo nile ha n'ala nile anāchi achi nke eze, bú Ahasuerọs, iseti aka megide ndi nāchọ ọdi-njọ-ha: ọ dighi kwa nwoke ọ bula guzoro n'iru ha; n'ihi na oké egwu-ha dakwasiri ndi nile di iche iche. 3 Ndi-isi nile nke ala nile anāchi achi, na ndi nọchiri anya eze, na ndi nāchi ala, na ndi nēje ozi eze nwere, ha nēye-kwa-ra ndi-Ju aka; n'ihi na oké egwu Mọdekai dakwasiri ha. 4 N'ihi na Mọdekai di uku n'ulo eze, akukọ-ya we nējezu n'ala nile anāchi achi: n'ihi na nwoke ahu, bú Mọdekai, nāga n'iru n'idi uku. 5 Ndi-Ju we were ntib͕u mma-agha na ob͕ub͕u na ila-n'iyì tib͕ue n'etiti ndi-iro-ha nile, me ndi nākpọ ha asì dika ọ tọrọ ha. 6 Ma nime Shushan, bú ulo uku eze, ndi-Ju b͕uru nnù ndikom na ọgu ise, me ka ha la n'iyì. 7 Ha b͕u-kwa-ra Pashandata, na Dalfon, na Aspata, 8 na Porata, na Adalia, na Aridata, 9 na Pamashta, na Arisai, na Aridai, na Vaizata, 10 bú umu-ndikom iri nke Heman nwa Hamedata, bú onye nākpab͕u ndi-Ju; ma ha esetighi aka-ha n'ihe-nluta-n'agha-ha. 11 N'ubọchi ahu ọnu-ọgugu ndi eb͕uru eb͕u na Shushan, bú ulo uku eze, biaruru n'iru eze. 12 Eze we si Esta, bú nwunye eze, Nime Shushan, bú ulo uku eze, ka ndi-Ju b͕uworo nnù ndikom na ọgu ise, na umu-ndikom iri Heman, me ka ha la n'iyì; gini kwa ka ha meworo n'ala anāchi achi nke fọduru nke eze? Ma gini bu aririọ-gi? agēnye kwa gi ya: gini bu kwa ọchichọ-gi ọzọ? agēme kwa ya. 13 Esta we si, Ọ buru na ọ di eze nma, ka enye kwa ndi-Ju ike echi, bú ndi nọ na Shushan, ime dika iwu ta si di, ka akwuba kwa umu-ndikom iri Heman n'elu osisi. 14 Eze we si ka eme ya otú a: ewe nye iwu nime Shushan; ha we kwuba umu-ndikom iri nke Heman. 15 Ndi-Ju ndi nọ na Shushan we kpọkọta kwa onwe-ha n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa Ada, b͕ue ọgu ndikom iri-na-ise nime Shushan; ma ha esetighi aka-ha n'ihe-nluta-n'agha-ha. 16 Ndi-Ju fọduru ndi nọ n'ala nile anāchi achi nke eze kpọkọta-kwa-ra onwe-ha, we guzo n'ihi ndu-ha, zuru ike pua n'aka ndi-iro-ha, b͕ue orú nnù ndikom uzọ iteghete na nnù asa na ọgu iri n'etiti ndi nākpọ ha asì; ma ha esetighi aka-ha n'ihe-nluta-n'agha-ha. 17 N'ubọchi nke-iri-na-atọ n'ọnwa Ada ka ha mere nka; ha we zuru ike n'ubọchi nke-iri-na-anọ nime ya, me ya ubọchi ọṅuṅu-manya-vine na ọṅù. 18 Ma ndi-Ju ndi nọ na Shushan kpọkọtara onwe-ha n'ubọchi nke-iri-na-atọ nime ya, na n'ubọchi nke-iri-na-anọ nime ya; ha we zuru ike n'ubọchi nke-iri-na-ise nime ya, me ya ubọchi ọṅuṅu-manya-vine na ọṅù. 19 N'ihi nka ndi-Ju nke obodo nile nēnweghi mb͕idi, bú ndi bi n'obodo nēnweghi mb͕idi, nēme ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa Ada ka ọ buru ubọchi ọṅù na ọṅuṅu-manya-vine, na ezi ubọchi, na ubọchi izigaritara onwe-ha òkè. 20 Mọdekai we de ihe ndia n'akwukwọ, zigara ndi-Ju nile akwukwọ, bú ndi nọ n'ala nile anāchi achi nke eze, bú Ahasuerọs, ma ndi nọ nso ma ndi nọ n'ebe di anya, 21 ime ka o guzosiri ha ike na ha ganēme ememe n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa Ada, na n'ubọchi nke-iri-na-ise nime ya, n'arọ nile ọ bula, 22 dika ubọchi nke ndi-Ju zuru ike nime ha pua n'aka ndi-iro-ha, na ọnwa ahu nke b͕anwere n'ebe ha nọ, isi n'ihe-nwuta ghọ ọṅù, isi kwa n'iru-újú ghọ ezi ubọchi: na ha ganēme ha ubọchi ọṅuṅu-manya-vine na nke ọṅù, na nke izigaritara onwe-ha òkè, na nke inye ndi-ob͕eye onyinye. 23 Ndi-Ju we nara ihe ahu nke ha malitere ime, na nke Mọdekai degara ha n'akwukwọ; 24 n'ihi na Heman nwa Hamedata, onye Egag, bú onye nākpab͕u ndi-Ju nile, chère èchìchè megide ndi-Ju ime ka ha la n'iyì, o we fe Pua, nke ahu bu nzà, ichusa ha, na ime ka ha la n'iyì; 25 ma mb͕e Esta batara n'iru eze, eze ji akwukwọ si ka èchìchè ọjọ ya, nke o chère megide ndi-Ju, ka o chigharikwasi n'isi-ya; ọ si kwa ka akwuba ya na umu-ya ndikom n'elu osisi. 26 N'ihi nka ka ha kpọrọ ubọchi ndia Purim, n'aha Pua ahu. N'ihi nka, bú n'ihi okwu nile nke akwukwọ a, na ihe ha huru bayere nka, na ihe biaruru ha aru, 27 n'ihi nka ka ndi-Ju mere ka o guzosie ike, ha we nara ihe a bayere onwe-ha, baye-kwa-ra nkpuru-ha, baye-kwa-ra ndi nile ndi nārapara n'aru-ha, ka o we ghara igabiga, bú na ha ganēme ememe n'ubọchi abua ndia dika odide-akwukwọ-ha si di, na dika mb͕e-ha ezubere ezube si di, n'arọ nile ọ bula; 28 na aganēcheta kwa ubọchi ndia me kwa ememe nime ha n'ọb͕ọ nile ọ bula, na ab͕uru ọ bula, na ala ọ bula anāchi achi, na obodo ọ bula; na ubọchi ndia nke Purim agaghi-esi kwa n'etiti ndi-Ju gabiga, na ncheta-ha agaghi-agwu kwa site na nkpuru-ha. 29 Esta, bú nwunye eze, nwa-nwayi Abihail, na Mọdekai, bú onye-Ju, we were ike nile de akwukwọ ime ka akwukwọ-ozi a nke-abua nke Purim guzosie ike. 30 O we zigara ndi-Ju nile akwukwọ, nke okwu udo na nke ezi-okwu di nime ha, rue ọgu ala anāchi achi isi na asa, bú nke ala-eze Ahasuerọs, 31 ime ka ubọchi ndia nke Purim guzosie ike nime mb͕e-ha ezubere ezube, dika Mọdekai, bú onye-Ju, na Esta, bú nwunye eze, mere ka ha guzosiere ha ike, na dika ha mere ka ha guzosiere onwe-ha, guzosi-kwa-ra nkpuru-ha, ike, bú okwu obubu-ọnu na ikwa-ákwá-ha. 32 Okwu-ọnu Esta we me ka okwu ndia nke Purim guzosie ike; ewe de ya n'akwukwọ.

Esta 10

1 Eze, bú Ahasuerọs, we me ka ala ahu na ala nile nke di oké osimiri buruburu tua utu. 2 Ma ọlu nile nke ike-ya na nke idi-ike-ya, na ọkukọ-isi nke idi-uku nke Mọdekai, bú nke eze mere ya ka ọ di uku, èdeghi ihe ndia n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Midia na Peasia? 3 N'ihi na Mọdekai, bú onye-Ju, nọsoro eze, bú Ahasuerọs, ọ di kwa uku n'etiti ndi-Ju, na onye ihe-ya tọrọ ọtutu umu-nne-ya utọ; ọ nāchọrọ ndi-ya ọdi-nma, nāgwa kwa nkpuru-ya nile okwu udo.

Job 1

1 Otù nwoke di n'ala Uz, Job bu aha-ya; nwoke ahu zuru okè, zi kwa ezi, ọ nātu kwa egwu Chineke, nēsi kwa n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya. 2 Ewe muara ya umu-ndikom asa na umu-ndinyom atọ. 3 Ihe-nnweta-ya di nnù ewu na aturu iri-na-asa na ọgu iri, na nnù camel asa na ọgu iri, na nnù ehi abua na ọgu iri ejikọrọ abua abua, na nnù nne-inyinya-ibu na ọgu ise, na ndi-orù bara uba nke-uku; nwoke ahu we di uku kari umu Iru-anyanwu nile. 4 Ma umu-ya ndikom jere me ọṅuṅu-manya-vine n'ulo nwoke ọ bula nime ha n'ubọchi-ya; ha zì-kwa-ra kpọ umu-nne-ha ndinyom atọ iso ha rie ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu. 5 O rue, mb͕e ubọchi nile nke ọṅuṅu-manya-vine-ha gasiri buruburu, na Job zìri do ha nsọ, o we bilie n'isi-ututu, sure àjà-nsure-ọku, dika ọnu-ọgugu ha nile si di: n'ihi na Job siri, Eleghi anya umum ndikom emehiweo, b͕akuta kwa Chineke azu n'obi-ha. Otú a ka Job nēme ubọchi nile. 6 Ubọchi we di na umu Chineke biara iguzo onwe-ha n'iru Jehova, Setan we bia kwa n'etiti ha. 7 Jehova we si Setan Òle ebe i si bia? Setan we za Jehova, si, Site n'igaghari n'uwa, na site n'ijeghari nime ya. 8 Jehova we si Setan Ì tukwasiwo obi-gi n'aru orùm, bú Job? na ọ dighi onye di ka ya n'uwa, ọ bu nwoke zuru okè, zi kwa ezi, nke nātu egwu Chineke, nēsi kwa n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya. 9 Setan we za Jehova, si, Ọ̀ bu n'efu ka Job nātu egwu Chineke? 10 Ọ̀ bughi Gi onwe-gi b͕aworo ya, b͕a-kwa-ra ulo-ya, b͕a-kwa-ra ihe nile o nwere, ogige buruburu? I gọziwo ọlu aka-ya abua, ihe-nnweta-ya ab͕asawo kwa n'ala. 11 Ma otú ọ di, biko setipu aka-Gi, metu ihe nile o nwere, ọ ghaghi kwa ib͕akuta Gi azu n'iru Gi. 12 Jehova we si Setan Le, ihe nile o nwere di n'aka-gi; nání esetila aka-gi metu aru-ya. Setan we si n'iru Jehova pua. 13 O rue, n'otù ubọchi, mb͕e umu-ya ndikom na umu-ya ndinyom nēri ihe nāṅu kwa manya-vine n'ulọ nwa-nne-ha, bú ọkpara, 14 na onye-ozi biakutere Job, si, Ìgwè ehi nādọ ihe eji gwu ala-ubi, ìgwè nne-inyinya-ibu nāta nri n'akuku ha: 15 ndi Sheba we dakwasi ha, chiri ha; ọzọ kwa, ha ewerewo ọnu mma-agha tib͕ue ndi nējere gi ozi; nání mu onwem we b͕apu, náním, igosi gi. 16 Mb͕e onye a nọ nēkwu, onye ọzọ bia-kwa-ra, si, Ọku nke Chineke esiwo n'elu-igwe da, rechapu ìgwe ewu na aturu, na ndi nējere gi ozi, ripia ha; nání mu onwem we b͕apu, náním, igosi gi. 17 Mb͕e onye a nọ nēkwu, onye ọzọ bia-kwa-ra, si, Ndi Kaldea doro usu atọ, made imegide camel, chiri ha, ọzọ kwa, ha were ọnu mma-agha tib͕ue ndi nējere gi ozi; nání mu onwem we b͕apu, náním, igosi gi. 18 Mb͕e onye a nọ nēkwu, onye ọzọ bia-kwa-ra, si, Umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom nēri ihe nāṅu kwa manya-vine n'ulo nwa-nne-ha, bú ọkpara: 19 ma, le, oké ifufe siri n'ofè ọzara bia, tie nkuku anọ nke ulo ahu, o we dakwasi umu-okorọbia ahu, ha we nwua; nání mu onwem we b͕apu, náním, igosi gi. 20 Job we bilie, dọwa uwe-nwuda-ya; kọpu isi-ya, da n'ala, kpọ isi ala; 21 o si, Ọtọ ka m'b͕ara si n'afọ nnem puta, ọtọ ka m'gāb͕a kwa laghachi n'ebe ahu: Jehova nyere, Jehova anarawo kwa; ka aha Jehova buru ihe agọziri agọzi. 22 N'ihe a nile Job emehieghi, ọ sighi kwa na Chineke mere ihe-nzuzu.

Job 2

1 Ubọchi we di na umu Chineke biara iguzo onwe-ha n'iru Jehova, Setan we bia kwa n'etiti ha iguzo onwe-ya n'iru Jehova. 2 Jehova we si Setan, Òle ebe i si bia? Setan we za Jehova, si, Site n'igaghari n'uwa, na site n'ijeghari nime ya. 3 Jehova we si Setan, Ì tukwasiwo obi-gi n'aru orùm, bú Job? na ọ dighi onye di ka ya n'uwa, ọ bu nwoke zuru okè, zi kwa ezi, nke nātu egwu Chineke, nēsi kwa n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya: ọ nọ nējide kwa izu-okè-ya, ma i nākpalim imegide ya, iloda ya n'efu. 4 Setan we za Jehova, si, Akpukpọ-aru lara akpukpọ-aru, ọbuná ihe nile nke madu nwere ka ọ gēnye n'ọnọdu ndu-ya. 5 Otú ọ di, biko, setipu aka-Gi, metu okpukpu-ya metu kwa anu-aru-ya, ọ ghaghi kwa ib͕akuta Gi azu n'iru Gi. 6 Jehova we si Setan, Le, ọ nọ n'aka-gi; nání debe ndu-ya. 7 Setan we si n'iru Jehova pua, were ihe-ofifi ọjọ tie Job, site n'ọbu-ukwu-ya rue opu-n'isi-ya. 8 O we were n'onwe-ya ejùjù iji kọ onwe-ya ọkọ; ya onwe-ya nānọdu kwa n'etiti ntu. 9 Nwunye-ya we si ya, Ì nọ nējide izu-okè-gi? b͕akuta Chineke azu, nwua. 10 Ọ si ya, Dika otù nime ndinyom nzuzu si ekwu, otú a ka i nēkwu. Àyi gānara kwa ezi ihe n'aka Chineke, ghara inara ihe ọjọ? Nihe a nile Job ejighi eb͕ub͕ere-onu-ya mehie. 11 Ndi-eyì atọ nke Job we nu ihe ọjọ a nile nke biakwasiri ya, ha we bia, nwoke ọ bula site n'ebe-ya; Elifaz, bú onye Timan; na Bildad, bú onye Shua, na Zofa, bú onye Neama: ha we zukọta n'otù ibia igosi ya ebere ha ji n'aru ya na ikasi ya obi. 12 Ha we welie anya-ha site n'ebe di anya, le ya, ma ha amataghi ya, ha we welie olu-ha, kwa ákwá. ha we dọwa, nwoke ọ bula uwe-nwuda-ya, ha we kpokwasi ájá n'isi-ha n'ikpoli ya n'ebe elu-igwe di. 13 Ha na ya we nānọko n'ala ubọchi asa ehihie na abali, ma ọ dighi onye nāgwa ya okwu; n'ihi na ha huru na o nēb͕u ya nb͕u nke-uku.

Job 3

1 Mb͕e ihe a gasiri, Job saghere ọnu-ya, kọcha ubọchi-ya. 2 Job we za, si: 3 Ka ubọchi nke amurum nime ya la n'iyì, Ya na abali ahu nke siri, Aturu ime nwa-nwoke. 4 Ka ubọchi ahu ghọ ọchichiri; Ka Chineke ghara isi n'elu ju ase ya, Ka ìhè ghara kwa imukwasi ya. 5 Ka ọchichiri na onyinyo ọnwu b͕aputa ya; Ka igwe-oji biri n'elu ya; Ka ihe nile nke nēme ka ubọchi b͕a ọchichiri me ka ọ tua egwu nke-uku. 6 Abali ahu, ka oké ọchichiri jide ya: Ka ọ ghara iṅuri ọṅu n'etiti ubọchi nile nke arọ; Ka ọ ghara ibata n'ọnu-ọgugu ọnwa. 7 Le, ka abali ahu ghọ nwayi-àgà; Ka iti-nkpu-ọṅù ghara ibà nime ya. 8 Ka ha bua ya ọnu, bú ndi nābu ubọchi ọnu, Ndi nọ na njikere ikpọte leviathan. 9 Ka kpakpando nile nke emumechi-ya b͕a ọchichiri: Ka ọ le anya ìhè, ìhè adighi kwa; Ka ọ ghara ile mbuboro-anya nke chi-ọbubọ anya: 10 N'ihi na o mechighi ọnu-uzọ afọ nke m'si nime ya puta, O zopughi kwa ọnọdu ọjọ n'anyam. 11 N'ìhi gini ka m'nēsighi n'àkpà-nwa nwua? N'ìhi gini ka m'nāputaghi n'afọ kubìe ume? 12 Gini mere ikperè abua di n'irum inaram? Ma-ọbu ara, ka m'we ṅua? 13 N'ihi na ub͕u a ka m'gēdinawori di jūM'gāraruwori ura; mb͕e ahu ka izu-ike gādirim: 14 Mu na ndi-eze na ndi-ndum-ọdu nke uwa, Ndi nēwuru onwe-ha nkpọnkpọ ebe; 15 Ma-ọbu mu na ndi-isi ndi nwere ọla-edo, Ndi nēmeju ulo-ha n'ọla-ọcha: 16 Ma-ọbu gini mere m'nādighi ka nwa amukworo amukwo nke ezoworo ezo; Dika umu ọhu nke nāhughi ìhè? 17 N'ebe ahu ka ndi nēmebi iwu rapuworo ime nkpatu; Ọ bu kwa n'ebe ahu ka ndi ike gwuru nēzu ike. 18 N'ebe ahu ka ndi-nkpọrọ nānọkọ jū; Ha anughi olu ndi nāchi ha n'ihe-ike. 19 Onye ntà na onye uku nọ n'ebe ahu, ha abua; Orù apuwo kwa n'aka onye-nwe-ya nwere onwe-ya. 20 N'ìhi gini ka O nēnye onye nọ n'ọnọdu ọjọ ìhè? N'ìhi gini kwa ka O nēnye ndi nkpuru-obi-ha di ilu ndu? 21 Ndi nēchere ọnwu, ma ọ dighi-abia; Ha nēgwu kwa ala-ya kari àkù zoro ezo; 22 Ndi nāṅuri rue otite-egwú-ọṅù, Obi nātọ kwa ha utọ mb͕e ha chọtara ílì. 23 N'ìhi gini ka O nēnye nwoke nke ezoworo uzọ-ya ìhè, Bú onye Chineke b͕ochiwo-kwa-ra ya? 24 N'ihi na ọ bu tutu eriem nrim ka ize-umem nābia, Anāwusi kwa ọb͕ub͕ọ-ujam nile dika miri. 25 N'ihi na oké egwu ka m'turu, o we biakwasim, Ihe nke m'turu ujọ biakute-kwa-ram. 26 Anọghm n'udo, anọghkwam jū, ezughkwam ike; Ma ime-nkpatu biara.

Job 4

1 Elifaz, bú onye Timan, we za, si, 2 Asi na otù onye anwa igwa gi okwu, ìke gāgwu gi? Ma ònye puru ib͕ọchi onwe-ya n'ikwa okwu? 3 Le, i dọwo ọtutu madu, aka na nti, I nēme kwa ka aka nke nādighi ike di ike. 4 Okwu-gi nēme ka onye nāsu ngọngọ guzosie ike, I nāb͕a kwa ikperè nēruru ala ume. 5 Ma ub͕u a ọ nābiakute gi, ike we gwu gi; Ọ nēmetu gi aru, i we ma jijiji. 6 Ọ̀ bughi egwu-Chineke-gi bu ntukwasi-obi-gi? Ọ̀ bughi kwa izu-okè uzọ-gi nile bu olile-anya-gi? 7 Biko, cheta, ònye laworo n'iyì, mb͕e ya onwe-ya bu onye nēmeghi ihe ọjọ? Ma-ọbu òle ebe ezipuwo ndi ziri ezi? 8 Dika m'huworo anya, ndi nēgwu ajọ ihe dika ala-ubi, Ndi nāgha kwa nmeb͕u dika nkpuru-ọghigha, ha nēwe ya dika ihe-ubi. 9 Site n'iku-ume Chineke ka ha nāla n'iyì, Site kwa n'ifufe nke iwe-Ya ka anēme ka ha gwusia. 10 Ọb͕ub͕ọ-uja ọdum, na olu ọdum nāb͕ọ uja, Na ezé umu-ọdum, ka emebiworo. 11 Oke-ọdum nāla n'iyì site n'enweghi ihe ọ dọb͕utara, Umu nke nne-ọdum ekesawo kwa onwe-ha. 12 Ma mu ka ezutara okwu n'ori nye, Ntim we nara ntakwu nke sitere na ya. 13 N'èchìchè sitere n'ọhù nile nke abali, Mb͕e oké ura nādakwasi madu, 14 Oké egwu zuterem, ya na ima-jijiji, O we me ka ọtutu ọkpukpum tua oké egwu. 15 Otù mọ we gabiga n'irum; Aji anu-arum we guzo ọtọ. 16 Ọ nēguzo eguzo, ma amataghm otú ọ di n'ile ya anya; Otù udi di n'iru anyam: Idebe-ọnu-du di, ma olu ka m'nānu, si, 17 Madu, ọ̀ gābu onye ezi omume kari Chineke? Nwòke gādi ọcha kari Onye kèworo ya? 18 Le, ọbuná ndi-orù-Ya ka Ọ nādighi-atukwasi obi; Ndi-mọ-ozi-Ya ka Ọ nēbo ebubo na ha bu ndi-nmehie: 19 Ò gesi kwa aṅa ghara ibo kari ndi bi n'ulo urọ? Nke ntọ-ala-ha di n'ájá, Ndi anāzọpia azọpia dika nla. 20 Site n'ututu rue anyasi anētib͕u ha: Ha nāla n'iyì rue mb͕e ebighi-ebi, ma ọ dighi onye nātukwasi ya obi. 21 Àdopughi udọ̀ ulo-ikwū-ha nime ha? Ha nānwu, ọ bughi kwa n'amam-ihe.

Job 5

1 Biko, kpọ òkù; ọ̀ di onye nāza gi? Ònyè n'etiti ndi nsọ ka i gēche kwa iru? 2 N'ihi na nkpasu-iwe nēb͕u onye b͕agọro ab͕ago n'uche-ya, Ekworo nēme kwa ka onye nenweghi uche nwua. 3 Mu onwem ahuwo onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ka ọ nāb͕a ngbọrọgwu: M'we bua ebe-obibi-ya ọnu na mberede. 4 Umu-ya nānọpu anya n'ebe nzọputa di, Ewe zọpia ha n'ọnu-uzọ-ama, Ọ dighi kwa onye nānaputa ha. 5 Onye onye-agu nēripia owuwe-ihe-ubi-ya, Nēsi kwa ọbuná n'ogwu were ya, Ọnyà nēkusi ume ike inwe àkù-ha. 6 N'ihi na ajọ ihe adighi-esi n'ájá puta, Ọ bughi kwa n'ala ka ọnọdu ọjọ si epuputa; 7 Kama anāmuputa madu nye ọnọdu ọjọ, Dika icheke-ọku nile nēfeli elu. 8 Ma mu onwem, m'gāchọ Chineke, Chineke ka m'gēbo kwa okwum: 9 Onye nēme ihe uku, nke ngwuputa ala-ha nādighi; Oké ọlu rue mb͕e ọnu-ọgugu adigh: 10 Onye nēnye miri-ozuzo n'elu ala, Nēziga kwa miri n'elu ebe di n'èzi: 11 Ido ndi di ala n'ebe di elu; Ndi nēyi uwe-nkpe nọ kwa n'elu nime nzọputa. 12 Ọ nēmebi èchìchè nile nke ndi-aghughọ, Aka-ha adighi-eme kwa ihe ha zubere. 13 Ọ nējide ndi mara ihe n'aghughọ-ha: Ndum-ọdu nke ndi nāb͕a nb͕a me-kwa-ra ngwa. 14 N'ehihie ka ha nēzute ọchichiri, Ha nāsọghari kwa ìsì n'etiti-ehihie, dika n'abali. 15 O we zọputa madu na mma-agha nke sitere n'ọnu-ha, Bú ndi-ob͕eye n'aka ndi di ike. 16 Onye nēnweghi ike we nwe olile-anya, Ma ajọ omume ekpuchiwo ọnu-ya. 17 Le, onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu, onye Chineke nābara nba: Aju-kwa-la idọ-aka-na-nti nke Onye puru ime ihe nile. 18 N'ihi na Onye ahu nēme ka ihe b͕ue nb͕u, Ọ nēké kwa eke; O nētib͕u, aka-Ya nēme kwa ka adiri ndu. 19 Nime nkpab͕u isi ka Ọ gānaputa gi; Ọzọ, n'asa ihe ọjọ agaghi-emetu gi aru. 20 N'oké unwu Ọ b͕aputawo gi n'ọnwu; B͕aputa kwa gi n'aka mma-agha n'agha. 21 Mb͕e ire nāpia utari agēzo gi; I gaghi-atu kwa egwu ihe-ike mb͕e ọ nābia. 22 I gāchì ihe-ike, chì kwa agu, ọchì; I gaghi-atu kwa egwu anu-ọhia nke uwa. 23 N'ihi na gi na nkume ọhia nile gādi n'ọb͕ub͕a-ndu; Gi na anu ọhia gādi kwa n'udo. 24 I gāma kwa na ulo-ikwū-gi di n'udo; I gēlekọta kwa ebe-obibi-gi, i gaghi-emehie kwa. 25 I gāma kwa na nkpuru-gi di ọtutu, Umu nke putara n'aru-gi gādi kwa ka ihe-ọkukú nke ala. 26 I gābia n'ílì n'ezib͕o agadi, Dika obo ọka si ala elu na mb͕e-ya. 27 Le nka, ayi egwuputawo ala-ya, otú a ka ọ di; Nuru ya, gi onwe-gi mata kwa ya n'onwe-gi.

Job 6

1 Job we za, si, 2 Biko, ka atùa nkpasu-iwem nke-ọma, Ka ha buli kwa nmebim n'ihe-ọtùtù n'otù! 3 N'ihi na ub͕u a ọ di arọ́ kari ájá oké osimiri nile: N'ihi ya ka okwum nile sihieworo uzọ. 4 N'ihi na àkú nile nke Onye puru ime ihe nile di nimem, Nke ńsí-ha ka mọm nāṅuIhe-egwu Chineke nēdo onwe-ha n'usoro imegidem. 5 Inyinya-ibu-ọhia, ò nēti nkpu n'elu ahihia ndu? Ma-ọbu ehi, ò nēti nkpu n'elu nri agwara agwara nye ya? 6 Ànēri ihe nke nādighi utọ n'ire, ma nnú adighi ya? Ma-ọbu ùtọ di na nke di ọcha nime àkwá? 7 Ihe nkpuru-obim nāju imetu, Ihe ndia di ka nrim nke mebiri emebi. 8 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na aririọm abia; Asi kwa na Chineke enyem olile-anyam! 9 Ọbuná ka Chineke kwe izọpiam; Ka Ọ tọpu aka-Ya, bipum. 10 Nkasi-obim we nādiru ub͕u a; M'we wulie elu n'ihe-nb͕u nke nādighi-enwe ọmiko: N'ihi na ezoghm okwu-ọnu nile nke Onye Nsọ. 11 Gini bu ikem na m'gēche? Gini bu kwa ọgwugwum, na m'gēme ka ndum di ogologo? 12 Ọ̀ bu ike nkume ka ikem bu? Ma-ọbu anu-arum, ọ̀ bu ọla? 13 Ọ̀ bughi na iye-akam adighi nimem? Na enupuwo kwa nzube-ihe n'ebe m'nọ? 14 Onye obi nālọ ya miri kwesiri inwe ebere site n'aka eyì-ya; Bú onye nārapu kwa egwu Onye Nke puru ime ihe nile. 15 Umu-nnem aghọb͕uwom dika miri-iyi, Dika ebe miri-iyi nke nērùbiga nērù; 16 Nke nēji nji n'ihi ice, Nke snow nēzó onwe-ya nime ha: 17 Na mb͕e anēme ka ha di ọku ha tọb͕ọro n'efu: Mb͕e ọ di ọku, ha tapuworo n'ọnọdu-ha. 18 Ndi-ije nke uzọ-ha nēchighari onwe-ha; Ha nārigo n'ebe tọb͕ọrọ n'efu, we la n'iyì. 19 Ndi-ije nke Tima legidere anya, Usu-ndi-ije nke Sheba lere anya ha. 20 Ihere mere ha n'ihi na ha tukwasiri ha obi; Ha biaruru ebe ahu, iru-ha we nwughari n'ihi ihere. 21 N'ihi na ub͕u a unu abughi ihe; Unu nāhu ihe-ujọ, we tua egwu. 22 Ọ̀ bu na m'siri, Nyenum ihe? Ma-ọbu, Nyenu ihe-iri-ngo n'ihim site n'àkù-unu? 23 Ma-ọbu, Wepuganum n'aka onye-nkpab͕u? Ma-ọbu, B͕aputanum n'aka ndi nēme ka madu ma jijiji? 24 Zínum ihe, mu onwem gāb͕a kwa nkiti: Me-kwa-num ka m'ghọta ihe m'mehieworo n'amaghi-ama. 25 Le ka okwu-ọnu nke ziri ezi si di irè! Ma gini ka iba-nba nke si n'ọnu-unu puta nābara? 26 Ùnu nēchè na unu gābara okwu nba? Ebe okwu-ọnu nile nke onye nādighi-atukwasi obi-ya n'ihe di ka ifufe. 27 Ọzọ kwa, n'aru nwa-nb͕ei ka unu nēfekwasi nzà, Unu nēwere kwa eyì-unu zua ahia. 28 Ma ub͕u a kwenu ichem iru; Ọ̀ bu kwa n'iru unu ka m'gēkwu okwu-ugha? 29 Biko, chigharianu, ka ajọ omume ghara idi; E, chigharianu ọzọ, ezi omumem di nime ya. 30 Ọ̀ di ajọ omume di n'irem? Òkpo-ọnum agaghi-amata ihe anāchọsi ike?

Job 7

1 Ọ̀ dighi obubu-agha diri madu n'elu uwa? Ùbọchi-ya adighi ka ubọchi onye egoro ọlu? 2 Dika orù si ekusie ume ike ibà n'okpuru ǹdò, Na dika onye egoro ọlu si ele anya ugwọ-olu-ya: 3 Otú a ka emeworom ha m'keta ọtutu ọnwa nke ihe-efu, Ọtutu abali nke m'nādọb͕u onwem n'ọlu ka ha gutawo-kwa-ra nyem. 4 Ọ buru na edinam, m'si, Òle mb͕e m'gēbili? ma anyasi esetiwo onwe-ya; Afọ ejuwokwam na ntugharim rue chi-ọbubọ. 5 Anu-arum nēyi ikpuru na ob͕e ájá; Akpukpọ-arum atawo ata, we b͕aze. 6 Ubọchim di garagara kari ọ́kpà eji kpa ákwà, Ha we gwusia nenweghi olile-anya. 7 Cheta na ndum bu ifufe: Anyam agaghi-alaghachi ihu ezi ihe. 8 Anya onye nāhum agaghi-ekirim: Anya-Gi gādi n'arum, ma m'gaghi-adi. 9 Dika igwe-oji si agwusi, we la, Otú a onye nārida n'ala agaghi-arigota. 10 Ọ gaghi-alata n'ulo-ya ọzọ, Ebe-ya agaghi-amata kwa ya ọzọ. 11 Mu onwem kwa, m'gaghi-eb͕ochi ọnum; Ka m'kwue nime nkpab͕u nke mọm; Ka m'tamue ntamu n'idi-ilu nke nkpuru-obim. 12 Ọ̀ bu oké osimiri ka m'bu, ma-ọbu ogologo anu nke di n'oké osimiri, Na I nēdo ndi-nche ichem? 13 Mb͕e m'siri, Ihe m'ji dina gākasim obi, Ihe-ndinam gēbupu ntamum; 14 I we were nrọ me ka m'tua ujọ, I site-kwa-ra n'ọhù me ka m'tua egwu nke-uku: 15 Nkpuru-obim we rọputa ntọb͕u, Na ọnwu kari ọkpukpum ndia. 16 Ajuwom ndu; m'gaghi-adi ndu rue mb͕e ebighi-ebi: Rapum; n'ihi na otù nku-ume ka ubọchim nile bu. 17 Gini ka madu bu, na I nēme ya ka ọ di uku, Na I nātukwasi kwa ya obi-Gi, 18 Na I nēleta kwa ya ututu nile, Na I nānwaputa ya na mb͕e dikarisiri ntà nile? 19 Rùe ole mb͕e ka I nāgaghi-elepum anya, Ka I nāgaghi-arapum rue mb͕e m'lodara ọnu-mirim? 20 Asi na emehiewom, gini ka m'nēme Gi, Gi Onye nēche madu? N'ìhi gini ka I doworom ibu ihe-ndakwasi n'ebe I nọ, M'we ghọrọ onwem ibu? 21 Ma gini mere I nādighi-ebupu njehiem, me ka ajọ omume gabiga? N'ihi na ub͕u a m'gēdina n'ájá: I gāchọsikwam ike, ma m'gaghi-anọ.

Job 8

1 Bildad, bú onye Shua, we za, si, 2 Rùe ole mb͕e ka i ganēkwu ihe ndia? Rù kwa ole mb͕e ka okwu nile nke ọnu-gi gābu ifufe di ike? 3 Chineke, Ọ̀ neme ka ikpé b͕agọ ab͕agọ? Ma-ọbu Onye Nke puru ime ihe nile, Ọ̀ nēme ka ezi omume b͕agọ ab͕agọ? 4 Ọ buru na umu-gi emehiewo megide Ya, Ọ we zilaga ha n'aka nmehie-ha: 5 Ọ buru na gi onwe-gi achọsie Chineke ike, We riọ Onye Nke puru ime ihe nile aririọ-amara; 6 Ọ buru na onye di ọcha n'obi na onye ziri ezi ka i bu; N'ezie ub͕u a Ọ gētetara gi, Me ka ebe-obibi nke ezi omume-gi di n'udo. 7 Ọ bu ezie na nmalite-gi di ntà, Ma ikpe-azu-gi gēbù ibù nke-uku. 8 N'ihi na, biko, jua ọb͕o mbu, Dozie onwe-gi imata ihe ndi bu nna-ha gwuputara: 9 (N'ihi na nke nnyahuru ka ayi bu, ayi amaghi kwa ihe, N'ihi na onyinyo ka ubọchi-ayi nile bu n'elu uwa: ) 10 Ndi ahu, hà agaghi-ezí gi ihe, gwa gi okwu, Si n'obi-ha weputa okwu? 11 Papyrus, Ò gētolite elu ma apiti adighi? Amì, ò gēbù ibù ma miri adighi? 12 Mb͕e ọ nọ n'ima akwukwọ ndu, mb͕e akēbighi ya, Ọ nēbu ahihia ọ bula uzọ akpọnwu. 13 Otú a ka okporo-uzọ ndi nile nēchezọ Chineke si di; Olile-anya nke onye emeruru emeru gāla n'iyì: 14 Onye agākpaji okwukwe efu ya, Ntukwasi-obi-ya bu kwa ulo ududo. 15 Ọ gādabere n'aru ulo-ya, ma ọ gaghi-eguzo: Ọ gējide ya, ma ọ gaghi-eguzosi ike. 16 Dika osisi ndu ka ọ di n'iru anyanwu, Ome-ya nēpusa n'ubi-ya ab͕ara ogige. 17 Nkpọrọgwu-ya nēkekọta onwe-ha n'aru obo nkume, Ọ nāhu ebe nkume anya. 18 Ọ buru na esi n'ebe-ya loda ya, Ọ gāgọnari kwa ya, si, Ahughm i. 19 Le, nka bu obi-utọ, nke uzọ-ya, Ma ndi ọzọ gēsi n'ájá pue. 20 Le, Chineke agaghi-aju onye zuru okè, Ọ gaghi-ejide kwa aka ndi nēme ihe ọjọ. 21 Rue mb͕e Ọ gēwere ichì-ọchì mejue ọnu-gi, Were kwa iti-nkpu mejue eb͕ub͕ere-ọnu-gi. 22 Ndi nākpọ gi asì gēyi ihere dika uwe; Ulo-ikwū nke ndi nēmebi iwu agaghi-adi kwa.

Job 9

1 Job we za, si, 2 N'ezie amawom na ọ di otú a: Ma madu, ò gēsi aṅa buru onye ezi omume n'iru Chineke? 3 Ọ buru na ọ tọ ya utọ iso Ya je n'ikpé, Ọ gaghi-aza Ya otù okwu nime nnù okwu abua na ọgu iri. 4 O nwere obi nke mara ihe, Ọ nāb͕a kwa ume n'ike: Ònye mere onwe-ya ka o sie ike imegide Ya, we nọ n'udo? 5 Onye nākwapu ugwu, ma ha amaghi ya, Mb͕e Ọ kwatuworo ha n'iwe-Ya. 6 Onye nēme ka uwa me nkpatu pua n'ọnọdu-ya, Ogidi-ya nile we ma jijiji. 7 Onye nāgwa anyanwu okwu, o we ghara iwa; Ọ nākachi kwa kpakpando akàrà. 8 Onye nání Ya nēseti elu-igwe, Nāzọkwasi kwa ebe nile di elu nke oké osimiri ukwu. 9 Onye nēme Bear, na Orion, na Pleiades, Na ime-ulo nke Ndida. 10 Onye nēme ihe uku, rue mb͕e ngwuputa ala-ha nādighi; Na oké ọlu rue mb͕e ọnu-ọgugu nādighi. 11 Le, Ọ nāgabiga n'akukum, ma adighm-ahu Ya: Ọ nāga kwa n'iru, ma adighm-amata Ya. 12 Le, Ọ nānwude ihe, ònye gēme ka Ọ laghachi azu? Ònye gāsi Ya, Gini ka I nēme? 13 Chineke agaghi-eme ka iwe-Ya laghachi; Ndi nēyere Rehab aka ruru ala n'okpuru Ya. 14 Mù onwem gēsi kwa aṅa za Ya, Rọputa kwa okwum nile m'gāgwa Ya? 15 Onye, ọ buru na abum onye ezi omume, m'gaghi-aza Ya; Kama m'gāriọ onye nēkpem ikpe aririọ-amara. 16 Ọ buru na m'kpọwo òkù, O we zam; M'gaghi-ekwe kwa na Ọ ṅara nti n'olum; 17 Bú Onye nēji oké ifufe chifiam aru, Onye nēme kwa ka ob͕ub͕u-mmam, bú nke eb͕urum, ba uba n'efù. 18 Ọ gaghi-ekwem ka m'turu ndu, Kama Ọ nēme ka afọ jum n'ihe-ilu nile. 19 Ọ buru na ayi ekwue okwu bayere ike nke onye nwe ume, le, Ọ nọ ya! Ma ọ buru na ayi ekwue okwu bayere ikpé, ònye gākaram mb͕e? 20 Ọ buru na abum onye ezi omume, ọnum gāmam ikpe: Onye zuru okè ka m'bu, o we si na abum onye b͕agọrọ ab͕agọ. 21 Onye zuru okè ka m'bu; adighm-amara nkpuru-obim; Ajum ndum. 22 Otù ihe aju ka ọ bu; n'ihi ya ka m'siri, Onye zuru okè na onye nēmebi iwu ka Ya onwe-ya nēme ka ha gwusia. 23 Ọ buru na utari eme ka madu nwua n'otù ntabi-anya, Ọ gāchì onwunwa onye nēmeghi ihe ọjọ ọchì. 24 Enyewo uwa n'aka onye-nmehie: Ọ nēkpuchi iru ndi-ikpe-ya; Ọ buru na ọ bughi Ya, ònye kwa ka ọ bu? 25 Ma ubọchim nile di garagara kari ọb͕a-ọsọ: Ha ab͕alagawo, ha ahughi ezi ihe. 26 Ha agabigawo n'iru dika ub͕o amì: Dika ugo si efedakwasi ngwa ngwa n'anu ọ gēri. 27 Ọ buru na asim, Ka m'chezọ ntamum, Ka m'rapu iru ujọm, b͕asa irum: 28 Anamatu ujọ ihe-nb͕um nile, Amawom na I gaghi-agum n'onye nēmeghi ihe ọjọ. 29 Agama mu onwem ikpe; N'ìhi gini kwa ka m'dọb͕uru onwem n'ọlu n'efu? 30 Ọ buru na ewerem miri snow sa arum, Were kwa nchà me ka ọbu-akam abua di ọcha; 31 Mb͕e ahu I gābiayem n'olùlù, Uwem gākpọkwam ihe-árú. 32 N'ihi na Ọ bughi madu, otú m'bu, na m'gāza Ya, Na ayi gābiakota n'ikpé. 33 Ọ dighi odozi-okwu di n'etiti ayi, Nke gātukwasi ayi abua aka-ya. 34 Ya wezuga nkpa-n'aka-Ya n'arum, Ka oké ujọ-Ya ghara ime ka m'tua egwu nke-uku: 35 Ka m'kwue okwu, ghara itu egwu Ya; N'ihi na ọ bughi otú a ka m'di n'ebe mu onwem nọ.

Job 10

1 Ike ndum agwuwo nkpuru-obim; Ka m'rapuru onwem ntamum; Ka m'kwue okwu n'idi-ilu nke nkpuru-obim. 2 M'gāsi Chineke, Amalam ikpe; Me ka m'mara ihe kpatara I ji som se okwu. 3 Ọ̀ di Gi nma ka I meb͕ue nmeb͕u, Ka I ju ndọb͕u-n'ọlu nke ọbu-aka-Gi abua, We mukwasi ìhè na ndum-ọdu ndi nēmebi iwu? 4 Ọ̀ bu anya anu-aru ka I nwere, Ma-ọbu na I nāhu dika madu si ahu? 5 Ọ̀ bu dika ubọchi madu si di ka ubọchi-Gi di? Ma-ọbu arọ-Gi, hà di ka ubọchi madu, 6 Na I nāchọ ajọ omumem, Nāju kwa ase nmehiem? 7 Ọ bu ezie na I mara na adighm-emebi iwu; Ọ dighi kwa onye ọ bula nānaputa n'aka-Gi. 8 Aka-Gi dozirim, we kpuamKa m'buru otù buruburu; ma I nēlodam. 9 Biko, cheta na dika urọ ka I kpuworom; Ì gēme kwa ka m'laghachi n'ájá? 10 Ọ̀ bughi dika miri-ara ka I nāwusim, Me ka m'raru araru dika cheese? 11 Akpukpọ-aru na anu-aru ka I yikwasirim, Were kwa ọkpukpu na akwara kpam dika ákwà. 12 Ndu na ebere ka I meworo ka m'nwe, Nlekọta-gi edebewo kwa mọm. 13 Ma I zoro ihe ndia n'obi-Gi; Amawom na nka di n'aka-Gi: 14 Ọ buru na emehiewom, I nēlezikwam anya, I gaghi-agupukwam n'ajọ omumem. 15 Ọ buru na emebiwom iwu, ahuhu dirim; Ọ buru kwa na abum onye ezi omume, m'gaghi-eweli isim elu; Ebe nlelìm juworom afọ, Ya na ilekwasi nwedam anya. 16 Ọ buru kwa na isim ewelie onwe-ya n'elu, dika ọdum nke nāb͕ọ uja ka I nāchu ntám: I we laghachi gosi Onwe-gi onye di ebube megidem. 17 I nēme ka ndi-àmà-Gi di ọhu n'irum, Nēme kwa ka nkpasu-iwe-Gi ba uba n'ebe m'nọ; Nb͕anwe na usu-ndi-agha di n'ebe m'nọ. 18 N'ìhi gini kwa ka I ji me ka m'si n'àkpà-nwa puta? M'gēkubìwori ume, ọ dighi kwa anya gāhum. 19 Dika agāsi na ọ dighi mb͕e m'nọ, otú a ka m'gādi; Site n'afọ nnem rue ílì ka agēbum. 20 Ùbọchim adighi ole-na-ole? rapu kwa, Dopu Onwe-gi n'ebe m'nọ, ka m'we b͕asa irum nwantī, 21 Tutu alam, ghara kwa ilaghachi, Rue ala ọchichiri, na onyinyo ọnwu; 22 Ala oké ọchichiri, dika oké ọchichiri onwe-ya; Ala onyinyo ọnwu, nke usoro nādighi ya, Ebe ọmumu-ìhè di kwa ka oké ọchichiri.

Job 11

1 Zofa, bú onye Neama, we za, si, 2 Àgaghi-aza ọtutu okwu? Àgāgu kwa onye eb͕ub͕ere-ọnu n'onye ezi omume? 3 Ekwukwu-Gi nile nēme ka madu b͕a nkiti; I we chìa ọchì, ma ọ dighi onye nēme ka ihere me gi. 4 I we si, Nmutam di ọcha, M'di kwa ọcha n'anya-Gi. 5 Ma otú ọ di, ọ gādim nọ̄ nma ma asi na Chineke ekwue okwu, Saghe eb͕ub͕ere-ọnu-Ya megide gi; 6 Gosi gi ihe-nzuzo nile nke amam-ihe, Na ọ di okpukpu n'izube ihe. Gi mara kwa na Chineke nēme ka echezọrọ gi ufọdu nime ajọ omume-gi. 7 Ì gēsi n'ogwugwu chọputa Chineke? Ì gāchọputa Onye Nke puru ime ihe nile rue ebe Ọ sọturu? 8 Ọ ra ka ebe di elu nile nke elu-igwe; gini ka i gēme? Ọ di omimi kari ala-mọ; gini ka i gāmara? 9 Ọtùtù-ya di ogologo kari uwa, Di kwa obosara kari oké osimiri. 10 Ọ buru na Ọ ga n'iru, mechibido madu uzọ, Kpọkọta nkpọkọta, ònye gēme kwa ka Ọ laghachi? 11 N'ihi na Ya onwe-ya mara madu efu: Ọ nāhu kwa ajọ ihe, mb͕e Ọ nādighi-elegide ya anya. 12 Ma nkpọkọrọ madu gēnwe obi, Mb͕e amuru nwa-inyinya-ibu-ọhia ka ọ buru madu. 13 Ọ buru na gi onwe-gi edozie obi-gi, We b͕asa ọbu-aka-gi abua n'ebe Ọ nọ; 14 Ọ buru na ajọ ihe adi n'aka-gi, me ka ọ di n'ebe di anya, Ekwe-kwa-la ka ajọ omume biri nulo-ikwū-gi nile; 15 N'ihi na mb͕e ahu i gēweli iru-gi nēnweghi ọlu n'aru-gi; I gābu kwa ihe siri ike dika ọla awuru awu, i gaghi-atu kwa egwu: 16 N'ihi na gi onwe-gi gēchezọ ọnọdu ọjọ gi, Dika miri nke gabigara agabiga ka i gēcheta ya: 17 Kari etiti-ehihie ka ubọchi ndu-gi gēbili kwa; Ọ buru na oké ọchichiri adi, ọ gādi ka ututu. 18 I gātukwasi kwa obi, n'ihi na olile-anya di; I gēnyocha kwa, were ntukwasi-obi dina. 19 Ọzọ kwa, i gāmakpu, ọ dighi kwa onye nēme ka i ma jijiji; Ọtutu madu gēme kwa ka iru-gi dajua. 20 Ma anya ndi nēmebi iwu gādala n'isi, Ebe-nb͕alaga alanariowo kwa ha n'iyì, Nkubì-ume bu kwa olile-anya-ha.

Job 12

1 Job we za, si, 2 N'ezie unu onwe-unu bu ndi bu ihe, Unu na amam-ihe gānwukọ n'otù. 3 Enwe-kwa-ram obi dika unu; Mu onwem abughi onye dara ada kari unu: Ma ònye ka ọ bu nke ihe dika ndia nādighi n'aka? 4 Onye bu ihe-ọchì nke madu-ibe-ya ka m'bu, Bú onye nākpọku Chineke, O we za ya: Ihe-ọchì ka onye ezi omume nke zuru okè bu. 5 Nleda diri ọdida n'èchìchè onye nọ jū; Edoziwo ya nye ndi ukwu-ha nāb͕uchapu ab͕uchapu. 6 Ulo-ikwū nile nke ndi nāpunara madu ihe di n'udo, Ntukwasi-obi di-kwa-ra ndi nākpasu Chineke iwe; Bú onye ọ bula nke wetaworo chi-ya n'aka-ya. 7 Ma otú ọ di, biko, jua anumanu, ha gēzí kwa gi ihe, Na anu-ufe nke elu-igwe, ha gēgosi kwa gi: 8 Ma-ọbu gi na uwa kparita uka, o gēzí kwa gi ihe; Azù nke oké osimiri gākọ-kwa-ra gi. 9 Ọ̀ bu onye nāmaghi n'ihe ndia nile, Na aka Jehova emewo nka? 10 Onye nkpuru-obi nke ihe ọ bula di ndu di n'aka-Ya, Ya na mọ nke anu-aru nile nke madu. 11 Nti, ọ̀ dighi-anwa okwu? Okpo-ọnu kwa, ọ̀ dighi-edeturu onwe-ya ihe-oriri-ya? 12 Nime ndi kara nká ka amam-ihe di, N'ubọchi ndu di ogologo ka nghọta di kwa. 13 N'aka-Ya ka amam-ihe na idi-ike di; Ọ nwere ndum-ọdu na nghọta. 14 Le, Ọ nākwada ihe, agaghi-ewu kwa ya ọzọ; Ọ nēmechibido madu uzọ, agaghi-emeghe kwa ya. 15 Le, Ọ nēb͕ochi miri, ha takọrọ; Ọzọ, ọ nēzipu ha, ha we kpùe uwa iru. 16 N'aka-Ya ka ike na nzube-ihe di; O nwere onye nēmehie n'amaghi-ama na onye nēme ka madu mehie n'amaghi-ama. 17 Ọ nēme ka ndi nādu ọdu la dika onye akwatara ihe-ya n'agha, Ọ nēme kwa ndi-ikpe ka ha ghọ ndi-nzuzu. 18 Ab͕u ndi-eze kere ka Ọ tọpuworo, We ke ihe-ọkiké n'úkwù-ha. 19 Ọ nēme ka ndi-nchu-àjà la dika onye akwatara ihe-ya nagha, Ndi nādigide ka Ọ nēme kwa ka ha kpùe iru. 20 Ọ nēwezuga okwu eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi kwesiri ntukwasi-obi, Ezi uche nke ndi-okenye ka Ọ nēwepu kwa. 21 Ọ nāwusa nleda n'aru ndi amara aha-ha, Akpukpọ-úkwù nke ndi di ike ka Ọ kpọpu-kwa-ra. 22 Ọ nēsi n'ọchichiri kpughepu ihe di omimi, We me ka onyinyo ọnwu puta ìhè. 23 Ọ nēme ka mba di uku, Ọ nēme kwa ka ha la n'iyì: Ọ nāb͕asa mba, nēdu kwa ha. 24 Ọ nēwezuga obi ndi-isi nke ndi uwa, We me ka ha waghari n'ebe tọb͕ọrọ n'efu ebe uzọ nādighi. 25 Ha nāsọghari ìsì n'ọchichiri nēnweghi ìhè, O we me ka ha kpafue dika onye ṅubigaworo manya ókè.

Job 13

1 Le, ihe a nile ka anyam huworo, Ntim anuwo, ghọta kwa ya. 2 Dika ọmuma-ihe-unu si di, otú a ka m'maworo, ọbuná mu onwem: Mu onwem abughi onye dara ada kari unu. 3 Ma mu onwem, Onye Nke puru ime ihe nile ka m'gāgwa okwu, Ọ nātọkwam utọ isoro Chineke ru uka. 4 Ma otú ọ di, unu onwe-unu bu ndi nētekpu madu okwu-ugha dika ihe-ntekpu, Ndi-dibia efu ka unu nile bu. 5 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na unu ab͕asi nkiti! Ọ we ghọro unu amam-ihe. 6 Biko, nurunu iru-ukam, Ṅa-kwa-nu nti n'ikpe-ọnu nile nke eb͕ub͕ere-ọnum. 7 Ọ̀ bu Chineke ka unu gēkwuru okwu ajọ omume? Ọ̀ bu Ya ka unu gēkwu-kwa-ra okwu aghughọ? 8 Ọ̀ bu Ya ka unu gāhu iru-ọma? Ọ̀ bu Chineke ka unu gāluru ọ̀gù? 9 Ọ̀ di nma ka O gwuputa ala unu? Ma-ọbu dika madu si akwa madu emò, ọ̀ bu otú a ka unu gākwa Ya emò? 10 Ọ ghaghi ibara unu nba, Ọ buru na unu ahu madu iru-ọma na nzuzo. 11 Nbùli-elu-Ya adighi-eme ka unu tua egwu nke-uku? Oké egwu-Ya adighi-adakwasi kwa unu? 12 Okwu-ncheta nile unu bu ilu nke ntu, Ihe-nb͕ochi urọ ka ihe-nb͕ochi nile unu bu. 13 B͕anu nkiti, pua n'ebe m'nọ, ka m'kwu kwa, mu onwem, Gini gāgabiga kwa n'arum? 14 N'ìhi gini ka m'gēburu anu-arum n'ezém, Tiye kwa ndum n'ọbu-akam? 15 Le, Ọ gēb͕um; m'gaghi-echere: Otú ọ di, uzọm nile ka m'gāru uka n'iru Ya. 16 Ọzọ, Ya onwe-ya gāburum nzọputa; N'ihi na onye emeruru emeru agaghi-abia n'iru Ya. 17 Nurunu okwum nile nke-ọma, Ka nkwuputam di kwa na nti-unu. 18 Biko, le, edowom ikpém n'usoro; Amawom na mu onwem bu onye ezi omume. 19 Ònye bu onye ahu nke mu na ya gēkpe ikpe? N'ihi na ub͕u a ka m'gāb͕a nkiti, kubìe ume. 20 Nání emelam ihe abua, Mb͕e ahu m'gaghi-ezopu onwem n'iru Gi: 21 Me ka ọbu-aka-Gi dipu n'arum n'ebe di anya; Ka oké ujọ-Gi ghara kwa ime ka m'tua egwu nke-uku. 22 Gi kpọ kwa òkù, mu onwem gāza kwa; Ma-ọbu ka m'kwue, I we zam. 23 Àjọ omume na nmehie m'nwere di ole? Me ka m'mara njehiem na nmehiem. 24 N'ìhi gini ka I nēzo iru-Gi, Nēchè kwa na mu bu onye-iro n'ebe I nọ? 25 Ì gēme ka akwukwọ osisi nke ifufe nēfepu ma jijiji? Ma-ọbu Ì gāchu ahihia ọ̄ka kpọrọ akpọ? 26 N'ihi na I nēde ihe di ilu n'akwukwọ megidem, I nēme kwa ka m'nweta ajọ omume nile m'mere n'okorọbiam: 27 I nētiye kwa ukwum abua n'ọtọsi, nēlezi kwa okporo-uzọm nile anya; I nākpa Onwe-gi ókè buruburu ọbu-ukwum: 28 Bú madu nke di ka ihe rere ure nke nāka nká, Dika uwe nke nla riworo.

Job 14

1 Madu nke nwayi muru, Ubọchi-ndu-ya di nkpunkpu, afọ ejuwo kwa ya n'ahuhu. 2 Dika okoko-osisi ka ọ putaworo, ewe nēbipu ya: O we nāb͕alaga dika onyinyo, ọ dighi-eguzo kwa. 3 Ọ̀ bu kwa n'aru onye a ka I megheworo anya-Gi, Me ka m'so Gi ba n'ikpé? 4 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ihe ọcha gāputa n'ihe ruru árú! ọ dighi otù ihe ọcha gāputa na ya. 5 Ebe ihe akara àkà ka ubọchi-ya nile bu, ọnu-ọgugu nke ọnwa-ya nile di n'aka-Gi, I mewo ókè-ya, ọ gaghi-agabiga kwa ya; 6 Lepu ya anya, ka o we kwusi, Rue mb͕e ubochi-ya gātọ ya utọ, dika onye egoro ọlu. 7 N'ihi na olile-anya diri osisi na ọ gēpute ọzọ, ma eb͕utue ya, Na ome-ya agaghi-akwusi kwa. 8 Ọ buru na nkpọrọgwu-ya eme ochie n'ala, Ogwe-ya anwu kwa n'ájá; 9 Site n'ísì miri ọ gāma akwukwọ, Wa kwa alaka dika ihe akuru aku. 10 Ma onye di ike gānwu, ike gāgwu kwa ya: Madu we kubìe ume, òle ebe ọ nọ kwa? 11 Miri esiwo n'oké osimiri la, Osimiri we tasia, takọrọ; 12 Otú a madu edinawo, ọ dighi-ebili kwa: Rue mb͕e elu-igwe nādighi, ha agaghi-eteta, Agaghi-akpọte kwa ha n'ura-ha. 13 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na I zobem n'ala-mọ, Ma asi na I debem na nzuzo, rue mb͕e iwe-Gi laghachiri, Ma asi na I kparam ókè, we chetam! 14 Ọ buru na madu anwua, ọ̀ gadi ndu ọzọ? Ubọchi nile nke obubu-agham ka m'gēche, Rue mb͕e nb͕anwem gābia. 15 I gākpọ òkù, mu onwem gāza kwa Gi: Agu ọlu aka-Gi gāgu Gi. 16 N'ihi na ubu a I nāgu nzọ-ukwum ọnu: Ì dighi-elezi nmehiem anya? 17 Akachiwo njehiem akàrà n'àkpà, I we tekpue ajọ omumem ihe. 18 Ma otú ọ di, ugwu nke nāda ada nāla n'iyì, Anākwapu kwa oké nkume n'ọnọdu ya. 19 Miri nēme ka nkume ta; Orúrú-ya nāṅachapu ájá ala: Olile-anya madu ka I mewo-kwa-ra ka ọ la n'iyì. 20 I nwere ike n'aru ya rue mb͕e ebighi-ebi, ọ we la; I nēme ka iru-ya b͕anwe, I we zilaga ya. 21 Anāsọpuru umu-ya ndikom, ma ọ dighi-ama ya; Ha nāghọ kwa ndi ntà, ma ọ dighi-amata ihe bayere ha. 22 Nání na o nēb͕u anu-aru-ya nke dikwasi ya nb͕u, Nkpuru-obi-ya nke di nime aru-ya nēru kwa újú.

Job 15

1 Elifaz, bú onye Timan, we za, si, 2 Onye mara ihe, ọ̀ gēwere ọmuma-ihe nke bu nání ifufe za? Ọ̀ gēmeju kwa afọ-ya n'ifufe Iru-anyanwu? 3 Ọ̀ gēwere okwu nābaghi n'ihe ru uka, Ma-ọbu okwu nke ọ nējighi ha bara madu urù? 4 E, gi onwe-gi nēmebi egwu, Nēbilata kwa ntughari-uche n'iru Chineke. 5 N'ihi na ajọ omume-gi nēzi ọnu-gi ihe, I nārọputa kwa ire ndi-aghughọ. 6 Ọnu-gi nāma gi ikpe, ọ bughi mu onwem; Eb͕ub͕ere-ọnu-gi nāza kwa imegide gi. 7 Ì bu madu mbu amuru? Ma-ọbu àmuputara gi tutu ugwu adi? 8 Ọ̀ bu ìzù nzuzo Chineke ka i nēge nti? Ì nēbilata-kwa-ra onwe-gi amam-ihe? 9 Gini ka i mara nke ayi nāmaghi? Ì nāghọta ihe nke nādighi nime ayi? 10 Ma onye-isi-awọ ma onye kara nká nọ n'etiti ayi, Ndi ubọchi ndu-ha ka nke nna-gi nke-uku. 11 Ǹkasi-obi Chineke adikara gi ntà, Ha na okwu nke nēmeso gi nwayọ? 12 Gini mere obi-gi ji ebupu gi? Gini me-kwa-ra anya-gi abua ji atabi? 13 Na i nēchighari mọ-gi imegide Chineke, We me ka okwu nile di otú a si n'ọnu-gi puta. 14 Gini ka madu bu, na ọ gādi ọcha n'obi, Na ọ gābu kwa onye ezi omume, bú onye nwayi muru? 15 Le, ọbuná ndi nsọ Ya ka Ọ nādighi-atukwasi obi; Ọzọ, elu-igwe adighi ọcha n'anya-Ya. 16 Ònye-árú nke b͕aruru ab͕aru dika miri gēsi kwa aṅa di ọcha n'anya-Ya, Bú madu nke nāṅu ajọ omume dika miri? 17 M'gēkwuputara gi, gem nti; Ma nka ka m'huworo, m'gākọ kwa ya: 18 (Nke ndi mara ihe nēgosiSite na ndi bu nna-ha, ha ezoghi kwa ya; 19 Ndi ahu, náni ha, ka enyere ala, Ọ dighi kwa ọbìa gabigara n'etiti ha: ) 20 Ubọchi nile nke onye nēmebi iwu ka onye ahu nāb͕ali, Bú ọnu-ọgugu arọ nke ezobeworo nye onye nēme ka madu ma jijiji. 21 Olu oké egwu di na nti-ya abua; Mb͕e ọ nọ n'udo ka onye nāpunara madu ihe gābiakute ya: 22 Ọ dighi-ekwe na ọ gēsi n'ochichiri lata, Onye anēche nche inye mma-agha ka ọ bu: 23 Onye nāwaghari ichọ nri ka ọ bu, ọ nāsi, Òle ebe ọ di? Ọ mawo na edoziwo ubochi ọchichiri n'aka-ya: 24 Ahuhu na nkpà nēme ka ọ tua egwu nke-uku; Ha nwere ike n'aru ya, dika eze nke nọ na njikere ibu agha: 25 N'ihi na o setipuwo aka-ya imegide Chineke, Ọ bu kwa imegide Onye Nke puru ime ihe nile ka ọ nēme onwe-ya onye di ike; 26 Ọ nēwere olu kwesiri ike b͕akwasi Ya, Were kwa ihe-nb͕ochi di ib͕idi nke ọta-ya: 27 Nihi na o werewo abuba-ya kpuchie iru-ya, Me ka abuba nke di arọ́ di n'úkwù-ya; 28 O we biri n'obodo ezopuru n'uwa, Nime ulo nke madu nādighi-ebi nime ha, Nke ejikereworo ighọ obo-ihe. 29 Ọ gāghi-abu ọgaranya, àkù-ya adighi-eguzosi kwa ike, Ọ dighi-eseti kwa ihe ha nwere n'uwa. 30 Ọ gaghi-esi n'ọchichiri wezuga onwe-ya; Ire-ọku gēme ka ome-ya kpọ nku, Ọ gēwezuga kwa onwe-ya site n'iku-ume nke ọnu-Ya. 31 Ka ọ ghara ikwere n'ihe-efu, eduhiewo ya: N'ihi na ihe-efu gābu ihe-nb͕anwe-ya. 32 Tutu ubọchi-ya erue ka agēmezu ya, Alaka-ya agaghi-adi ka ahihia ndu. 33 Ọ gēnwosisi nkpuru-vine-ya nke nāchaghi acha, dika osisi vine, Ọ gātuda kwa okoko-osisi-ya, dika osisi olive. 34 N'ihi na nzukọ nke onye emeruru emeru gābu ndi nāpughi imu nwa, Ọku gēripia ulo-ikwū nile nke ndi-ngo. 35 Ha nāturu ime ọnọdu ọjọ, mua ajọ ihe, Afọ-ha nēdozi kwa aghughọ.

Job 16

1 Job we za, si, 2 Anuwom ọtutu ihe dika ihe ndia: Ndi-nkasi-obi nēweta ọnọdu ọjọ ka unu nile bu. 3 Òkwu nke bu nání ifufe gēnwe ọgwugwu? Ma-ọbu gini nēme gi ka i di irè, na i nāza okwu? 4 Ka mu onwem kwu kwa okwu dika unu; Ọ buru na nkpuru-obi-unu adi n'ọnọdu nkpuru-obim, M'gēnwe ike ijikọta okwu imegide unu, Na ifufe isim imegide unu. 5 M'gēwere ọnum b͕a unu ume, Nmeghari eb͕ub͕ere-ọnum gēb͕ochi kwa ihe-nb͕u-unu. 6 Ọ buru na ekwuem, adighi-eb͕ochi ihe-nb͕um: Ma ọ buru na arapum, gini gēsi n'arum la? 7 Otú ọ di, ub͕u a O mewo ka ike gwum: I mewo ka nzukọm nile ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu. 8 I we jisiem ike, ọ ghọwo ihe-àmà megidem: Ọtita-arum we nēbili imegidem, Ọ nāzam n'iru. 9 Iwe-ya adọkawom O we kpọm asì; Ọ takwasiwom ikekere ezé-Ya: Onye-nkpab͕um nāchichapu anya-Ya n'arum. 10 Ha asaghepuwo ọnu-ha n'arum, Were ita-uta tiem aka na ǹtì: Ha nāchikọzu onwe-ha n'otù imegidem. 11 Chineke nēmechibidom uzọ nye ndi ajọ omume, N'aka ndi nēmebi iwu ka Ọ nātubàkwam. 12 Anọm n'udo, O we mebiem; Ọzọ, O jidewo olum, piajisiam, Me ka m'biliere Onwe-ya ibu ihe O dotara ib͕a àkú. 13 Àkú-Ya nile dim buruburu, Ọ nāb͕awa akurum, Ọ dighi-enwe kwa ọmiko n'arum; Ọ nāwusi òlùlùm n'ala. 14 O nētipúm ntipú n'elu ntipú-ibe-ya; Ọ nāb͕akwasim dika dike. 15 Ákwà-nkpe ka m'dukọtaworo n'elu akpukpọ-arum, Turughari mpim n'ájá. 16 Irum nācha ọbara-ọbara site n'ikwa-ákwá, Na mbubere-anyam ka onyinyo ọnwu di kwa; 17 Ọ bughi n'ihi na ihe-ike di n'ọbu-akam, Ekperem di kwa ọcha. 18 Ala, ekpuchila ọbaram, Ka ọnọdu ghara idiri iti-nkpum. 19 Ọbuná ub͕u a, le, n'elu-igwe ka Onye-àmàm nọ, Onye nēkwurum nọ kwa n'ebe di elu. 20 Ndi-eyìm bu ndi nākwam emò: Ma ọ bu n'ebe Chineke nọ ka anyam nātusisi anya-miri; 21 Ka otù onye we so Chineke ruara madu uka, Dika nwa nke madu si aruara madu-ibe-ya uka. 22 N'ihi na arọ ole-na-ole gābia, M'we je n'uzọ m'gaghi-alaghachi.

Job 17

1 Emebiwo mọm, emewo ka ubọchim gwusia, Ílì dirim. 2 N'ezie ikwa-emò diyerem, Anyam nānọ kwa ọnọdu-abali n'ikpasu-obi-ilu nile ha. 3 Biko, do ihe-ibe, burum onye-mbe n'ebe Gi onwe-gi nọ; Ònye ka ọ bu, bú onye gānaram n'aka? 4 N'ihi na I zopuwo obi-ha n'inwe ezi uche: N'ihi ya I gaghi-ebuli ha elu. 5 Onye nēgosi ndi-eyì-ya inara òkè, Ọbuná anya umu-ya gādala n'isi. 6 Ọzọ, O guzowom dika ilu nke ndi nile di iche iche; Onye ha nābusa ọnu-miri n'iru-ya ka m'ghọwo-kwa-ra. 7 Anyam we nāhu inyoghi-inyoghi site na nkpasu-iwe, Ihe dim n'aru di ka onyinyo, ha nile. 8 Ibobo bayere nka gānwu ndi ziri ezi n'aru, Onye nēmeghi ihe ọjọ gākpọte kwa onwe-ya imegide onye emeruru emeru. 9 Ma onye ezi omume gējisi ike n'iso uzọ-ya, Onye nke aka-ya abua di ọcha ganāga n'iru n'iru n'inwe ume. 10 Ma otú ọ di, biko, unu nile chigharia, bia: Ma m'gaghi-achọta onye mara ihe n'etiti unu. 11 Ubọchim nile agabigawo, emebiwo nzubem nile, Bú ihe-nnweta nke obim. 12 Ha nēdo abali n'ọnọdu ehihie: Ha nāsi, Ìhè di nso iru ọchichiri. 13 Ọ buru na elem anya ala-mọ na ọ gābu ụlọm; Ọ buru na ab͕asawom utem n'ọchichiri; 14 Ọ buru na akpọwom olùlù òkù, si, Nnam ka i bu; Kpọ kwa ikpuru òkù, si, Nnem na nwa-nnem nwayi ka i bu; 15 Òle ebe kwa ka olile-anyam di ub͕u a? Olile-anyam kwa, ònye gēkiri ya? 16 Rue ihe di n'ala-mọ ka ha gārida, Ọ buru na izu-ike adirim otù mbe ahu n'ájá.

Job 18

1 Bildad, bú onye Shua, we za, si, 2 Rùe ole mb͕e unu ganēsiri okwu ọnyà? Ghọtanu, ma emesia ayi gēkwu. 3 Gini mere aguworo ayi ka anumanu? Ayi aghọwo ndi ruru árú n'anya-unu. 4 Ọ nādọka onwe-ya n'iwe-ya. Àgārapu uwa n'ihi gi? Ma-ọbu àgākwapu oké nkume n'ọnọdu-ya? 5 Ọzọ, agēmenyu ìhè nke ndi nēmebi iwu, Ọ dighi kwa ire-ọku nke ọku-ya gēnwu. 6 Ìhè aghọwo ọchichiri n'ulo-ikwū-ya, Agēmenyu kwa oriọna-ya n'elu ya. 7 Agākpagide nzọ-ukwu nile nke ume-ya, Ndum-ọdu-ya gātuda kwa ya. 8 N'ihi na eji ukwu-ya abua ziga ya n'ub͕u eji eb͕u anu, Ọ nējeghari kwa n'elu ihe-ntuhi. 9 Ib͕udu gādakwasi ya n'ikiri-ukwu, Ọnyà gāma ya. 10 Ezobeworo ya udọ̀ n'ala, Na ihe iji nwude ya n'elu uzọ. 11 Ihe-egwu emewo ka ọ tua egwu nke-uku buruburu, Ha we chugharia ya n'ukwu-ya. 12 Agu ganāgu ume-ya, Edoziwo kwa nhuju-anya n'akuku-ya. 13 Ọ gēripia ihe di n'akpukpọ-aru-ya, Ọkpara ọnwu gēripia ihe nile di ya n'aru. 14 Agādọpusi ya ike n'ulo-ikwū-ya, bú ihe-ntukwasi-obi-ya; Agēme ka ọ zọrọ ukwu gakuru eze nke ihe-egwu nile. 15 Ihe nābughi nke ya gēbi n'ulo-ikwū-ya: Agēfesa brimstone n'elu ebe-obibi-ya. 16 Nkpọrọgwu-ya gākpọ nku n'okpuru, Agēbipu kwa alaka-ya n'elu. 17 Ncheta-ya alawo n'iyì pua n'uwa, Ọ dighi kwa aha ọ gēnwe n'èzí. 18 Agākwapu ya n'ihè ba n'ọchichiri, Agēme kwa ka o si n'elu-uwa dum madu bi waghari. 19 Ọ dighi umu, ọ dighi kwa umu umu, ọ gēnwe n'etiti ndi-ya, Ọ dighi kwa onye fọduru n'ọnọdu-ọbìa-ya nile. 20 Ibobo bayere ubọchi-ya anwuwo ndi bi n'akuku Ọdida-anyanwu n'aru, Ndi bi n'akuku Iru-anyanwu atuwo kwa oké ujọ. 21 Otú ọ di, ndia bu ebe-obibi nke ajọ omume, Nka bu kwa ebe onye nāmaghi Chineke.

Job 19

1 Job we za, si, 2 Rùe ole mb͕e unu gēme ka nkpuru-obim rue újú? Rùe ole mb͕e unu gēwere okwu zọpiam? 3 Ub͕ò iri ndia ka unu nēme ka ihere mem: Ihere adighi-eme unu na unu nēmejọm. 4 Ọzọ kwa, ọ bu ezie na emehiewom n'amaghi-ama, Ma n'ebe m'nọ ka nmehiem m'mehiere n'amaghi-ama di. 5 Ọ buru na ọ bu ezie na ọ bu imegidem ka unu nēme onwe-unu uku, Ọ buru kwa na unu ewere ita-utam som ru uka: 6 Maranu ub͕u a na Chineke merem ka m'bagọ ab͕agọ, Na O siwo-kwa-ram ọnyà-Ya buruburu. 7 Le, anameti nkpu, si, Ihe-ike! ma adighi-azam: Anametiku Chineke, ma ikpé adighi. 8 Ọ b͕achiwo okporo-uzọm, m'gaghi-agabiga kwa, N'uzọm nile ka Ọ nēdokwasi kwa ọchichiri. 9 O yipuwo nsọpurum n'arum dika uwe, We wezuga okpu-eze n'isim. 10 Ọ nākwatum buruburu, m'we la: O we ropu olile-anyam dika osisi. 11 O me ka iwe-Ya di ọku imegidem, Ọ guaram Onwe-ya dika ndi nēmegide Ya. 12 Usu-Ya nile ndi nāpunara madu ihe nābiakọta, tulie uzọ-ha imegidem, Ma kwa ulo-ikwū-ha buruburu ulo-ikwūm. 13 O mewo ka umu-nnem nọpurum n'ebe di anya, Ndi maworom we ghọ nání ndi ala ọzọ n'ebe m'nọ. 14 Ndi-ab͕ata-obim akwusiwo, Ndi m'mara echezọwokwam. 15 Ndi nọ n'ulom dika ọbìa na ndi-orum nwayi nāgum n'onye ala ọzọ: Onye anāmataghi ka m'ghọworo n'anya-ha. 16 Akpọwom arùm òkù, ma ọ dighi-azam, Anameji ọnum riọ ya aririọ-amara. 17 Iku-umem aghọwo iku-ume onye nābughi di-ya n'ebe nwunyem nọ, Ariọwokwam umu afọ nnem aririọ-amara. 18 Ọbuná umu nāṅu ara ajuwom; Ọ buru na ebiliem, ha we nēkwugidem. 19 Ndi-ìzum nile nākpọm ihe-árú: Ndi ahu m'huru n'anya echighariwo imegidem. 20 Ọkpukpum nārapara n'akpukpọ-arum na n'anu-arum, M'we were akpukpọ ezém wepuga onwem. 21 Merenum amara, merenum amara, unu onwe-unu, bú ndi-eyìm; N'ihi na aka Chineke emetuwom n'aru. 22 N'ìhi gini ka unu nāchum dika Chineke? N'ìhi gini ka anu-arum adighi-eju unu afọ? 23 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ede okwum nile n'akwukwọ ub͕u a! Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na akà ha n'akwukwo! 24 Ma asi na eji pen ígwè na òpùKa ha n'oké nkume rue mb͕e ebighi-ebi! 25 Ma mu onwem amawo na Onye-nb͕aputam di ndu, Na O gēbili kwa ọtọ n'elu ájá n'ikpe-azu: 26 Mb͕e emebisi-kwa-ra akpukpọ-arum nka, Ọ bu na m'gēsi n'anu-arum hu Chineke: 27 Onye mu onwem gāhuru onwem, Anyam abua gāhu kwa Ya, Ọ bughi kwa onye ala ọzọ. Akurum abua agwusiwo n'imem. 28 Ọ buru na unu asi, Àyi gēsi aṅa chu ya? Ma achọtawo nkpọrọgwu okwu nimem; 29 Tuanu ujọ n'iru mma-agha: N'ihi na ọnuma nēweta ahuhu-ajọ-omume nile nke mma-agha, Ka unu we mara na ikpé di.

Job 20

1 Zofa, bú onye Neama, we za, si, 2 N'ihi nka ka èchìchèm nāzaghachim, Ọbuná n'ihi ime-ngwam nke di nimem. 3 Anuwom ọdidọ-aka-na-nti nke nētiyem n'ọnọdu-ihere, Mọ nke nghọtam nāzakwam. 4 Ì mawo nka site na mb͕e ochie, Site na mb͕e edoro madu n'elu uwa, 5 Na iti-nkpu-ọǹù nke ndi nēmebi iwu di nkpunkpu, Na ọṅù nke onye emeruru emeru nādi kwa rue mb͕e ntabi-anya? 6 Ọ buru na nbuli-ya arigorue elu-igwe, Isi-ya ewe metu igwe-oji; 7 Dika ǹsí-ya ka ọ gāla n'iyì rue mb͕e ebighi-ebi: Ndi huworo ya gāsi, Òle ebe ọ nọ? 8 Dika nrọ ka ọ gēfelaga, agaghi-achọta kwa ya: Agēme kwa ka o fepu dika ọhù abali. 9 Anya ahuwo ya, ma ọ gaghi-ahu kwa ya ọzọ; Ọnọdu-ya agaghi-ekiri kwa ya ọzọ. 10 Umu-ya gāchọ iru-oma ndi-ob͕eye, Aka-ya abua gēnyeghachi kwa àkù-ya. 11 Ọkpukpu-ya nile juputara n'ume okorọbia-ya, Ma o gēso ya dina n'elu ájá. 12 Ọ buru na ihe ọjọ atọ utọ n'ọnu-ya, Ọ buru na o zobe ya n'okpuru ire-ya; 13 Ọ buru na o nwe ọmiko n'aru ya, we ghara irapu ya, Kama ọ nēb͕ochi ya nokpo-ọnu-ya; 14 Nri-ya nke di na ngiri-afọ-ya ab͕anwewo, Ọ bu òlùlù aju-ala n'ime-ya. 15 O lodawo àkù, we b͕oputa ya: Chineke gēsi n'afọ-ya napu ya àkù ahu. 16 Nsi aju-ala ka ọ gāmiri: Ire agwọ gēb͕u ya. 17 Ọ gaghi-ele miri-iyi anya, Bú osimiri miri-iyi nke manu-aṅu na miri-ara-ehi raru araru. 18 Ọ nēnyeghachi ihe ọ dọb͕uru onwe-ya n'ọlu inwe, ọ gaghi-eleda ya; Dika àkù nke ihe-nb͕anwe-ya si di, ọ gaghi-aṅuri ọṅu otú a. 19 N'ihi na ọ zopiawo ndi-ob͕eye, rapu kwa ha; Ọ napuwo ulo n'ike, ọ gaghi-ewu kwa ya. 20 N'ihi na ọ dighi-ama udo n'afọ-ya, Ya mere ọ gaghi-eji ihe-ya anāchọsi ike wepuga onwe-ya. 21 Ọ dighi ihe fọduru nke ọ nērighi; N'ihi ya ọdi-nma-ya agaghi-adi ike. 22 N'ojuju nke ozùzù-ya nkpà nākpà ya: Aka onye ọ bula nke nọ n'ọnọdu ọjọ gābiakwasi ya. 23 Ka o rue, n'iriju afọ-ya, Na Chineke gēzitere ya idi-ọku nke iwe-Ya, Na Ọ gēme kwa ka o zokwasi ya dika miri-ozuzo nime nri-ya. 24 Ọ gēsi n'ihe-ekike-agha ígwè b͕alaga, Uta ọla gāb͕apue ya. 25 Ọ dọputawo ya, o we si n'aru-ya puta: Ọnu-ọnu-ya nke nēb͕upu àmùmà nēsi kwa n'òlùlù-ya puta; Oké ujọ nile di n'aru ya. 26 Ọchichiri nile ka ezobeworo ibu ihe-ya atukobara atukọba: Ọku nke anāfunwughi afunwu gēripia ya; Ọ gērechapu ihe fọduru n'ulo-ikwū-ya. 27 Elu-igwe gēkpughe ajọ omume-ya, Ala nēbili kwa imegide ya. 28 Agēme ka ihe-omume nke ulo-ya je biri n'ala ọzọ, Àkù-ya bu ihe anāwusi awusi n'ubọchi iwe-Ya. 29 Nka bu òkè madu nke nēmebi iwu site n'aka Chineke, Na ihe-nketa-ya nke Chineke siri ya keta.

Job 21

1 Job we za, si, 2 Nurunu okwum nke-ọma; Ka nka buru kwa nkasi-obi-nnu. 3 Nagidenum, mu onwem gēkwu kwa okwu; Ma mb͕e m'kwusiri okwu, i gāchì ọchì. 4 Mu onwem, ọ̀ bu madu ka m'nātamuru ntamu? Ma ọ buru na ọ di otú a, gini mere mọm nējighi arapu ibu ihe nādighi-ewe iwe ọsọsọ? 5 Chenum iru, ka ibobo nwu kwa unu n'aru, Tukwasi-kwa-nu aka n'ọnu. 6 Ọ buru kwa na echetam, anam-ama jijiji, Ima-jijiji ejidewo kwa anu-arum. 7 Gini mere ndi nēmebi iwu nādi ndu, Ghọ okenye, nābu kwa ndi di ike bu dìnkpà? 8 Emewo ka nkpuru-ha so ha guzosie ike n'iru ha, Emewo kwa ka umu nke putara n'aru-ha guzosie ike n'anya-ha. 9 Ulo-ha di n'udo pua n'oké egwu, Nkpa-n'aka Chineke adighi kwa n'aru ha. 10 Oke-ehi-ya nāb͕à nne-ehi, ọ dighi-ab͕ahie; Nne-ehi-ya nāmu nwa, ọ dighi-ekwo ime. 11 Ha nēzipu umu-ha nāṅu ara dika ìgwè ewu na aturu, Umu-ha nēte kwa egwú. 12 Ha nēweli olu-ha n'egwú-otiti na ubọ-akwara, Nāṅuri kwa ọǹu n'olu ọ̀jà. 13 Ha nāla ubọchi nile ha n'iyì n'ọdi-nma, Ma n'otù ntabi-anya ha nārida n'ala-mọ. 14 Ha we si Chineke, Si n'ebe ayi nọ wezuga Onwe-gi; N'ihi na ọmuma uzọ-Gi nile atọghi ayi utọ. 15 Gini bu Onye Nke puru ime ihe nile, nke ayi gābu orù-Ya? Gini ka ọ gābara ayi, ma ayi riọ Ya aririọ? 16 Le, ọ bughi n'aka-ha ka ọdi-nma-ha di: Ndum-ọdu nke ndi nēmebi iwu di anya n'ebe m'nọ. 17 Ùb͕ò ole ka anēmenyu oriọna ndi nēmebi iwu? Ùb͕ò ole ka nhuju-anya-ha nābiakwasi ha? Ùb͕ò ole ka Chineke nēkesa ihe-nb͕u n'iwe-Ya? 18 Ùb͕ò ole ka ha di ka ahihia-ọka n'iru ifufe, Na dika ib͕ob͕o-ọka nke oké ifufe nēzupu dika onye-ori? 19 Unu nāsi, Chineke nēzobere umu-ya ajọ ihe-ya. Ka Ọ kwughachi onye ahu n'onwe-ya, ka o we mara ya. 20 Ka anya-ya abua hu nbibi-ya, Ya ṅua ufọdu nime ọnuma nke Onye Nke puru ime ihe nile. 21 N'ihi na ìhe ulo-ya gēsi aṅa tọ ya utọ mb͕e ọ nwusiri, Mb͕e ekepusiri ọnu-ọgugu ọnwa-ya nile n'etiti? 22 Ọ̀ di onye gēzí Chineke ọmuma-ihe? Ebe Ya onwe-ya nēkpe ndi di elu ikpe. 23 Otù onye nānwu n'ume-ya zuru okè, Mb͕e ọ nānọzu jū na n'udo: 24 Ihe-ya nile juputara na miri-ara-ehi, Umi ọkpukpu-ya nile edewo kwa miri. 25 Onye ọzọ nānwu n'ilu nkpuru-obi, Ọ dighi kwa mb͕e o riri ezi ihe. 26 Ha abua n'otù, n'elu ájá ka ha nēdinakọ, Ikpuru nēkpuchi kwa ha. 27 Le, amawom èchìchè-unu, Na nzube nile unu ji megidem ihe-ike. 28 N'ihi na unu nāsi, Òle ebe ulo onye-isi di? Òle ebe ulo-ikwū nke ebe-obibi ndi nēmebi iwu di kwa? 29 Ùnu ajughi ndi nāgabiga n'uzọ? Ùnu amaghi kwa ihe-iriba-ama-ha? 30 Na ọ bu rue ubọchi nhuju-anya ka anēb͕ochi onye ọjọ? Na ọ bu rue ubọchi ọnuma ka anēdupu ha? 31 Ònye gēgosi uzọ-ya n'iru ya? Ihe ahu kwa nke o mere, ònye gākwughachi ya? 32 Ma agēburu onye ahu rue ílì, Ọ gēche kwa nche n'elu obo-ya. 33 Ọkpurukpu-àjà nke ndagwurugwu gātọ ya utọ, Madu nile gādọrọ onwe-ha iso ya n'azu, Dika ndi anāpughi igu ọnu buru ya uzọ. 34 Ùnu si kwa aṅa kasiem obi n'efu, Ebe nání nmekpu fọduru nime nzaghachi nile unu?

Job 22

1 Elifaz, bú onye Timan, we za, si, 2 Ọ̀ bu Chineke ka madu nābara n'ihe? É-è, kama onye nwere uche nābara onwe-ya n'ihe. 3 Ọ̀ nātọ Onye puru ime ihe nile utọ na i bu onye ezi omume? Ma-ọbu ọ̀ bu urù n'ebe Ọ nọ na i nēme ka uzọ-gi nile zue okè? 4 Ọ̀ bu egwu-gi kpatara O ji bara gi nba, We so gi ba n'ikpé? 5 Ìhe ọjọ gi abaghi uba? Ọ dighi kwa nsọtu diri ajọ omume-gi. 6 N'ihi na i narawo nwa-nne-gi ihe-ibe n'efu, Uwe nile nke ndi b͕a ọtọ ka i nēyipu kwa. 7 I dighi-eme ka onye nāda #mbà ṅua miri, I nēb͕ochi kwa nri n'ebe onye-agu nọ. 8 Ma nwoke nke ogwe-aka-ya di ike, ọ bu ya nwe uwa; Onye anāhu iru-ọma nēbi kwa nime ya. 9 I zipuwo ndinyom di-ha nwuru n'aka efu, Anānyaji kwa ogwe-aka nke umu-nb͕ei. 10 N'ihi ya ib͕udu di gi buruburu, Oké egwu mberede nāma kwa gi jijiji, 11 Ma-ọbu ọchichiri, nke i nādighi-ahu anya, Na njubiga miri nēkpuchi gi. 12 Chìneke anọghi n'ebe di elu nke elu-igwe? Le kwa idi-elu kpakpando, na ha di elu! 13 I we si, Gini ka Chineke mara? Ò gēsi n'azu oké ochichiri kpe ikpe? 14 Igwe-oji b͕ara ọchichiri nāburu Ya ebe-nzuzo, Ọ dighi-ahu kwa uzọ; Ọ bu kwa buruburu elu-igwe ka Ọ nējeghari. 15 Ì gēdebe uzọ ochie, Nke ndikom nēme ajọ ihe zọkwasiworo ukwu? 16 Bú ndi apunara, ma mb͕e-ha akērughi, Ndi awusiri ntọ-ala-ha dika osimiri: 17 Ndi nāsi Chineke, Si n'ebe ayi nọ wezuga Onwe-gi: Ọzọ, Gini ka Onye puru ime ihe nile gēmere ha? 18 Ma Ya onwe-ya mejuru ulo nile ha n'ezi ihe: Ma ndum-ọdu ndi nēmebi iwu di anya n'ebe m'nọ. 19 Ndi ezi omume nāhu ya, we ṅuria; Onye nēmeghi ihe ọjọ nāchì kwa ha ọchì: 20 Si, N'ezie ezopuwo ha n'uwa, bú ndi nēbili imegide ayi, Ọku eripiawo kwa ihe-ha fọduru. 21 Biko, mara Ya nke-ọma, we nọ n'udo: Nime ihe ndia ka ọdi-nma gābiakute gi. 22 Biko, nara iwu n'ọnu-Ya, Do kwa okwu-Ya nile n'obi-gi. 23 Ọ buru na i laghachikute Onye puru ime ihe nile, agēwuli gi elu dika ulo; I gēme ka ajọ omume di anya n'ebe ulo-ikwū-gi nile di. 24 Tọb͕ọ kwa àkù-gi n'elu ájá, Na ọla-edo Ofia n'etiti nkume miri-iyi; 25 Onye puru ime ihe nile gābu kwa àkù-gi, Ọla-ọcha di oké ọnu-ahia ka Ọ gābu-kwa-ra gi. 26 N'ihi na mb͕e ahu ihe nke onye puru ime ihe nile gātọ gi utọ, I gēwelite-kwa-ra Chineke iru-gi. 27 I gāriọ Ya aririọ, Ọ gānu kwa gi; I gākwughachi kwa nkwa-gi nile. 28 I gēkwubì kwa okwu, ewe me ka o guzosiere gi ike; Ìhè gāmukwasi kwa uzọ-gi nile. 29 Mb͕e ha gēme ka i di ala, i gāsi, Nweli-elu di; Onye anya-ya ruru ala ka Ọ gāzọputa kwa. 30 Ọ gēme ka onye nābughi onye nēmeghi ihe ọjọ wepuga onwe-ya: E, o werewo idi-ọcha nke ọbu-aka-gi abua wepuga onwe-ya.

Job 23

1 Job we za, si, 2 Ọbuná ta nnupu-isi ka ntamum bu: Akam di arọ́ n'ihi ize-umem. 3 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na amaram ebe m'gāchọta Ya! Ma asi na agamabiaru ọnọdu-Ya guzosiri ike! 4 Ka m'do ikpém n'usoro n'iru Ya, Meju kwa onum n'iru-uka. 5 Kam'mara okwu nile Ọ gāzaghachim, Ka m'ghọta kwa ihe Ọ gāsim. 6 Ọ̀ bu n'uba ǹke ike-Ya ka O gēkpesom ikpe? É-è; kama Ya onwe-ya gēchem iru. 7 N'ebe ahu ka onye ziri ezi nēso Ya ru uka; Ewe me ka m'b͕apu n'aka Onye-ikpem rue mb͕e ebighi-ebi. 8 Le, m'ga n'iru, ma Ọ nọghi ya; M'ga kwa n'azu, ma adighm-ahuta Ya: 9 M'ga n'aka-ekpe, mb͕e Ọ nālu ọlu, ma adighm-ahu Ya anya: Ọ nēkpuchi Onwe-ya n'aka-nri, m'we ghara ihu Ya. 10 N'ihi na Ọ mawo uzọ m'nāga; Mb͕e Ọ nwaputasirim, dika ọla-edo ka m'gāputa. 11 Nzọ-ukwu-Ya ka ukwum nējisi ike iso; Uzọ-Ya ka m'debeworo, adighm-ewezuga kwa onwem. 12 Adighm-apu kwa n'ihe enyere n'iwu nke eb͕ub͕ere-ọnu-Ya; Atukọbawom okwu nile nke ọnu-Ya kari òkèm. 13 Ma Ya onwe-ya nọ n'otù èchìchè, ònye kwa gechighari Ya? Nkpuru-obi-Ya achọsiwo kwa ike, O we me ya. 14 N'ihi na Ọ nēmezu ihe bu òkèm: Ma ọtutu ihe dika ihe ndia di n'aka-Ya. 15 N'ihi ya ka m'nāma jijiji n'iru Ya; Anamaghọta, m'nātu kwa oké egwu Ya. 16 N'ihi na Chineke emewo ka obim lọ miri, Onye puru ime ihe nile emewo kwa ka m'ma jijiji: 17 N'ihi na ekpochapughm n'iru ọchichiri, O kpuchighi kwa oké ọchichiri n'irum.

Job 24

1 Gini mere Onye puru ime ihe nile nējighi tukọba mb͕e? Gini mere ndi mara Ya nējighi hu ubọchi-Ya nile? 2 Ufọdu nēwezuga ókè-ala; Ha anapuwo kwa ìgwè aturu n'ike, we nāzù ha. 3 Ha nākpupu inyinya-ibu nke umu-nb͕ei, Ha nānara kwa ehi nke nwayi di-ya nwuru n'ihe-ibe. 4 Ha nēsi n'uzọ wezuga ndi-ob͕eye: Ndi ewedara n'ala nke uwa ezobekowo onwe-ha n'otù. 5 Le, dika inyinya-ibu-ọhia n'ọzaraKa ha nāpu ije ọlu-ha, nāchọsi nri-ọtita-ha ike; Ala ihe nādighi nēmere ha nri umu-ha gēri. 6 N'ọhia ka ha nile n'otù n'otù nwe nri-ha agwara agwa dika ihe-ubi; Ha nātutukọ kwa nkpuru-vine fọduru n'ubi-vine onye nēmebi iwu. 7 Ha nānọ ọnọdu-abali b͕ara ọtọ nēnweghi uwe, Ọ dighi kwa ihe-nb͕okwasi ha nwere n'oyi. 8 Oké miri-ozuzo nke ugwu nēde ha, Ma ebe ha nēnweghi ebe-nb͕abà, ha we b͕akua oké nkume. 9 Ufọdu nānapu nwa-nb͕ei n'ara n'ike, Nara kwa onye ewedara n'ala ihe-ibe: 10 Ha we nējeghari b͕ara ọtọ nēnweghi uwe, N'agu-ha ka ha nēbu kwa ùkwù-ọka; 11 N'etiti mb͕idi-ha ka ha nāpi manu; Ebe-nzọcha-nkpuru-vine nile ha ka ha nāzọ ukwu, ma akpiri nākpọ ha nku. 12 Ha nēsi n'obodo ndikom sua udè, Nkpuru-obi ndi emeruworo aru nētiku Chineke: Ma Chineke adighi-agu ya n'ihe-nzuzu. 13 Ndi ahu nọ n'etiti ndi nānupu isi n'okpuru ìhè; Ha amataghi uzọ-ya nile, Ha ebighi kwa n'okporo-uzọ-ya nile. 14 Ìhè ututu ka ob͕u-madu ji bilie, o nēb͕u onye ewedara n'ala na ob͕eye; N'abali kwa ọ di ka onye-ori. 15 Ọzọ, anya onye nākwa iko nāriba chi-ojiji ama, Si, Ọ dighi anya ọ bula gēkirim: Ọ nēzobe iru-ya. 16 O gwupúwo ulo n'ọchichiri: N'ehihie ha nēmechibido onwe-ha uzọ; Ha amaghi ìhè. 17 N'ihi na ututu buru usu ha nile onyinyo ọnwu; N'ihi na ọ nāmata ihe-egwu nile nke onyinyo ọnwu. 18 Onye di nfe n'elu miri ka ọ bu; Anākọcha òkè-ha n'uwa: Ọ dighi-eche uzọ ubi-vine iru. 19 Ikpọ-nku na okpom-ọku nānapu miri snow n'ike: Otú a ka ala-mọ nēme ndi mehieworo. 20 Àkpà-nwa gēchezọ ya, aru-ya gātọ ikpuru utọ n'oriri; Agaghi-echeta kwa ya ọzọ: Agānyaji kwa ajọ omume dika osisi. 21 Ọ nēmeb͕u nwayi-àgà nke nādighi-amu nwa; Ọ dighi-eme kwa nwayi di-ya nwuru nma. 22 Ma O mewo ka ndi di ike nke-uku nādigide ndu site n'ike-Ya: O nēbili, ma ọ dighi onye kwere na ọ gādi ndu. 23 Chineke nēme ka ọ nọ na ntukwasi-obi, ọ nādabere kwa na ya; Ma anya-Ya dikwasi n'uzọ nile ha. 24 Ha di elu; na nwa mb͕e ha anọghi; Akwadawo kwa ha, chikọba ha dika madu nile, Ewe bipu ha dika ọnu-ọnu oko ọka. 25 Ma ọ buru na ọ dighi otú a ub͕u a, ònye gēme ka amara na abum onye-ugha, Me okwum ka ọ buru ihe-efu?

Job 25

1 Bildad, bú onye Shua we za, si, 2 Ọchichi na oké egwu di n'aka-Ya; O nēme udo n'ebe-Ya nile di elu. 3 Usu-Ya, hà nwere ọnu-ọgugu? Ònye kwa ka ìhè-Ya nādighi-awakwasi? 4 Màdu gēsi kwa aṅa buru onye ezi omume n'iru Chineke? Ma-ọbu, ò gēsi aṅa di ọcha n'obi, bú onye nwayi muru? 5 Le, ọbuná ọnwa adighi-eti, Ọzọ, kpakpando adighi ọcha n'anya-Ya: 6 Ò gēsi kwa aṅa di ọcha, bú madu, nke bu nání ikpuru? Ma-ọbu nwa nke madu, nke bu nání idide?

Job 26

1 Job we za, si, 2 Ì siwo aṅa yere ya aka, bú onye nēnweghi ike? Í siwo aṅa zọputa ogwe-aka nke ume nādighi? 3 Ì siwo aṅa dua ya ọdu, bú onye nāmaghi ihe? Ì siwo kwa aṅa me ka amara nzube-ihe n'uba? 4 Ònye ka i gosiworo okwu? Ọ̀ bu kwa onye ume-ya siri nime gi puta? 5 Ndi nādighi ndu nāma jijijiN'okpuru miri na ihe nile nēbi nime ya. 6 Ala-mọ b͕a ọtọ n'iru Ya, Ọ dighi kwa ihe-nb͕okwasi ebe-ila-n'iyì nwere. 7 Ọ nēseti Ugwu n'elu ebe tọb͕ọrọ n'efu, O nēkokwasi kwa uwa n'ihe nābughi ihe. 8 Ọ nēkechi miri n'oké igwe-oji-Ya; Ma ab͕awaghi igwe-oji n'okpuru ya. 9 Ọ nējisi iru oche-eze-Ya ike, Nāb͕asa igwe-oji-Ya n'elu ya. 10 Ọ kpawo ókè buruburu n'elu miri, Rue nsọtu ìhè na ọchichiri. 11 Ogidi nile nke elu-igwe nāma jijiji, Ibobo nānwu ha site n'ibasi-nba-ike-Ya. 12 Ike-Ya ka O ji me oké osimiri ka o dere du, Nghọta-Ya kwa ka O ji tib͕u Rehab. 13 Esitere n'aka Mọ-Ya chọ elu-igwe nma; Aka-Ya adupúwo agwó nāb͕a ọsọ. 14 Le, ndia bu nání nsọtu uzọ-Ya nile: Le kwa otú ọ di ntà, bú ntakwu okwu anuworo bayere Ya! Ma éb͕è-elu-igwe nke idi-ike-Ya nile, ònye gāghọta ya?

Job 27

1 Job we malite itu ilu-ya ọzọ, si, 2 Chineke nādi ndu, Onye wezugara ikpém; Onye puru ime ihe nile nādi kwa ndu, bú Onye mere ka nkpuru-obim di ilu; 3 (N'ihi na ogologo mb͕e nile umem di nimem, Mọ nke Chineke di kwa n'imem; ) 4 N'ezie eb͕ub͕ere-ọnum adighi-ekwu okwu ajọ omume, Irem adighi-atamu kwa ntamu aghughọ. 5 Ya burum ihe-árú ọ buru na aguam unu na ndi ezi omume: Rue mb͕e m'kubìri ume m'gaghi-esi n'ebe m'nọ wezuga izu-okèm. 6 Ezi omumem ka m'jideworo, m'gaghia ara kwa ya aka: Obim adighi-atam uta bayere otù n'ubọchim nile. 7 Ka onye-irom di ka onye nēmebi iwu, Ka onye nēbili imegidem di kwa ka onye ajọ omume. 8 N'ihi na gini bu olile-anya onye emeruru emeru, mb͕e Chineke nēbipu ya, Mb͕e Chineke nēsepu nkpuru-obi-ya? 9 Chineke, Ọ̀ gānu iti-nkpu-ya, Mb͕e nkpab͕u nābiakwasi ya? 10 Ìhe nke Onye puru ime ihe nile gātọ ya utọ? Ọ̀ gākpọku Chineke na mb͕e nile? 11 M'gēzí unu ihe site n'aka Chineke; M'gaghi-ezobe ihe nke di n'aka Onye puru ime ihe nile. 12 Le, unu onwe-unu nile ahuwo ya; N'ìhi gini kwa ka unu nāghọsi ihe-efu? 13 Nka bu òkè madu nēmebi iwu n'ebe Chineke nọ, Na ihe-nketa nke ndi nēme ka madu ma jijiji, nke ha nānara n'aka Onye puru ime ihe nile. 14 Ọ buru na umu-ya amuba, ọ bu inye mma-agha; Umu nke putara n'aru-ya agaghi-eriju kwa nri afọ. 15 Agēli ndi-ya fọduru n'ọnwu, Ndinyom-ya di-ha nwuru agaghi-akwa ákwá. 16 Ọ buru na ọ kwakọba ọla-ọcha dika ájá, Dozie uwe dika urọ; 17 O gēdozi ya, ma onye ezi omume gēyi ya, Onye nēmeghi ihe ọjọ gēkè kwa ọla-ọcha. 18 O wuwo ulo-ya dika nla, Na dika ulo-ntu nke onye-nche meworo. 19 O nēdina buru ọgaranya, ma agaghi-achikọta ya; Ọ saghewo anya ya abua, ma ọ nọghi. 20 Ihe-egwu nēru ya aru dika miri; Oké ifufe ezupuwo ya n'abali. 21 Ifufe Iru-anyanwu nēburu ya, o we la; O we fechapu ya n'ọnọdu-ya. 22 Chinke gātu kwa ya ihe, ghara kwa inwe ọmiko n'aru-ya: N'aka-Ya ka o gēsi b͕alaga ab͕alaga. 23 Madu gākuru ya aka, Ma ya ọsọ chupu ya n'ọnọdu-ya.

Job 28

1 N'ihi na ebe ọla-ọcha si aputa di, Na ebe nke diri ọla-edo ahu ha nānucha anucha. 2 Anēsi n'ájá eweputa ígwè, Anāwu kwa nkume ighọ ọla. 3 Madu emewo ọchichiri ka o nwe ọgwugwu, Rue nsọtu nile ka ya onwe-ya nēgwuputa kwaNkume nke oké ọchichiri na onyinyo ọnwu. 4 O siwo n'ebe madu nọ dika ọbìa tua ọnu; Ha bu ndi ukwu nke nāga aga nēchezọ; Anākwuba ha udọ̀ n'ebe di madu anya, ha nākwufeghari. 5 Ala, nime ya ka nri si aputa: Ma n'okpuru ya ka atughariworo ya dika ọ bu ọku mere ya. 6 Ọnọdu sapphire ka nkume-ya nile bu, Ọ nwe-kwa-ra ájá ọla-edo. 7 Ọ bu uzọ nke udele nāmaghi, Anya agu-nkwọ ahughi kwa ya: 8 Anu-ọhia di nganga azọghi ya ukwu, Ọdum nāb͕ọ uja agabigaghi kwa n'elu ya. 9 Oké nkume ọmu ka o setipuworo aka-ya imegide; Okpùwo ugwu iru site na nkpọrọgwu-ha. 10 N'oké nkume nile ka ọ waputaworo uzọ miri si erù; Anya-ya ahuwo kwa ihe ọ bula di oké ọnu-ahia. 11 O kechiwo osimiri ka ha ghara itu miri; Ihe-nzuzo ka ọ nēme kwa ka ọ puta ìhè. 12 Ma amam-ihe, òle ebe agāchọputa ya? Òle ebe kwa ka ọ bu, bú ọnọdu nghọta? 13 Madu amaghi ọ̀rùrù-ọnu-ya; Agaghi-achọta kwa ya n'ala ndi di ndu. 14 Ob͕u-miri siri, Ọ bughi nimem ka ọ di: Oké osimiri si-kwa-ra, Ọ dighi n'akam. 15 Adighi-enye ọla-edo makarisiri nma n'ọnọdu ya, Adighi-atù kwa ọla-ọcha ibu ọnu-ahia-ya. 16 Adighi-eji ọla-edo ọma nke Ofia, Adighi-eji kwa onyx di oké ọnu-ahia, ma-ọbu sapphire, tù ya. 17 Adighi-ewere ọla-edo na enyo turu ya: Ihe ọla-edo anuchara anucha abughi kwa ihe-nb͕anwe-ya. 18 Agaghi-ehota coral na crystal: E, nnweta amam-ihe kariri ruby. 19 Adighi-ewere topaz nke Etiopia turu ya, Adighi-eji ọla-edo ọma anāgwaghi agwa tù ya. 20 Ma amam-ihe, òle ebe o si bia? Òle ebe kwa ka ọ bu, bú ọnọdu nghọta? 21 N'ihi na ezonariwo ya n'anya ihe nile di ndu, Esiwo kwa n'anu-ufe nke elu-igwe zopu ya. 22 Ebe-ila-n'iyì na ọnwu siri, Na nti-ayi ka ayi nuworo akukọ-ya. 23 Chineke aghọtawo uzọ-ya, Ya onwe-ya amawo kwa ọnọdu-ya. 24 N'ihi na Ya onwe-ya nēlegide ihe anya rue nsọtu nile nke uwa, N'okpuru elu-igwe nile ka Ọ nāhu ihe; 25 Imere ifufe ihe-ọtùtù; Miri ka Ọ tùwo-kwa-ra n'ọtùtù. 26 Mbe Ọ tọrọ ukpuru nye miri-ozuzo, Dozi kwa uzọ nye àmùmà nke éb͕è-elu-igwe: 27 Mb͕e ahu ka Ọ huru ya, we kọ akukọ-ya; O mere ka o guzosie ike, O gwuputara ala-ya. 28 O we si madu, Le, egwu Onye-nwe-ayi, nke ahu bu amam-ihe; Ọzọ, isi n'ihe ọjọ puta bu nghọta.

Job 29

1 Job we malite itu ilu-ya ọzọ, si, 2 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na adim dika m'si di n'ọnwa gara aga, Dika n'ubọchi nile mb͕e Chineke nēdebem; 3 Mb͕e o nēnwu n'elu isim, bú oriọna-Ya, Ìhè-Ya ka m'nēji eje ije n'ọchichiri; 4 Otú m'diri n'ubọchi ihe nāgaram nke-ọma, Mb͕e ìzù nzuzo Chineke dikwasi ulo-ikwūm; 5 Mb͕e Onye puru ime ihe nile nānọyerem, Mb͕e umu-ntakirim nọrom buruburu; 6 Mb͕e ewere miri-ara-ehi raru araru sa nzọ-ukwum nile, Mb͕e oké nkume nāwuputaram miri-iyi nke bu nání manu! 7 Mb͕e m'puru je rue ọnu-uzọ-ama n'akuku obodo, Mb͕e m'nēdozi ebe-ọnọdum n'amá, 8 Umu-okorọbia hurum, zobe onwe-ha, Ndi kara nká biliri, guzo; 9 Ndi-isi kwubìri okwu nile ha, Tukwasi ọbu-aka-ha n'ọnu-ha; 10 Anubìri olu ndi-ndú, Ire-ha rapa-kwa-ra n'okpo-ọnu-ha; 11 N'ihi na nti nurum, we kpọm onye ihe nāgara nke-ọma; Anya hu-kwa-ram, we b͕aram àmà: 12 N'ihi na m'mere onye ewedara n'ala nke nētikum ka o wepuga onwe-ya, Ya na nwa-nb͕ei, bú onye nēnweghi onye nēyere ya aka. 13 Ngọzi nke onye nāla n'iyì nābiakwasim: M'nēme kwa obi nwayi di-ya nwuru ka o tie nkpu ọṅù. 14 Ezi omume ka m'yiri dika uwe, o we werem yikwasi onwe-ya: Ezi ikpém di ka uwe-nwuda na ákwà-ike-n'isi. 15 Anya ka m'ghọro n'ebe onye-ìsì nọ, Ukwu n'ebe onye-ngwurọ nọ ka m'ghọ-kwa-ra. 16 Nna ka m'buru ndi-ob͕eye: Okwu-ikpé m'nāmaghi kwa, anamegwuputa ala-ya. 17 M'we tijie ikiri-ezé nke onye ajọ omume, Si n'ezé-ya tupu anu ọ dọb͕uru. 18 M'we si, N'akwum ka m'gēkubì ume, Dika ájá ka m'gēme kwa ka ubọchim ba uba: 19 Awasawo nkpọrọgwum n'ebe miri di, Igirigi gānọ kwa ọnọdu-abali n'alakam: 20 Nsọpurum di ọhu nimem, Utam gāb͕anwe kwa ọhu n'akam. 21 Mu ka madu gere nti, we chere, Ha nānọ kwa dū inu ndum-ọdum. 22 Mb͕e okwum gwusiri, ha adighi-ekwu kwa okwu-ha nke ub͕ò abua; Okwum nābukwasi kwa ha dika miri-ozuzo. 23 Ha nēcherekwam dika esi echere miri-ozuzo; Ha saghepu-kwa-ra ọnu-ha dika ọ bu inara miri-ozuzo ikpe-azu. 24 M'chìa ha ọchì, ha adighi-ekwere; Ha adighi-eme kwa ka ìhè irum da. 25 M'nārọputa uzọ-ha, nọdu kwa ka onye-isi, Biri kwa dika eze si ebi n'usu-ya, Dika onye nākasi ndi nēru újú obi.

Job 30

1 Ma ub͕u a ha achìwom ọchì, bú ndi bu nwata karim, Ndi m'juru ido ndi bu nna-ha n'etiti nkita nke ìgwè ewu na aturu nkem. 2 Ọzọ, ike aka-ha, gini ka ọ gābaram? Ndi ike nke agadi-ha laworo n'iyì. 3 N'ihi ihe-ukọ na n'ihi agu ha bu ndi nēnweghi ike imu nwa: Ha bu ndi nēwere ezé-ha kọ̀cha ala ọkpọ-nku, nke bu nkpọnkpọ ebe na ebe tọb͕ọrọ n'efu na mb͕e gara aga. 4 Ndi nānyajipu mallow n'akuku umu-osisi; Nkpọrọgwu osisi broom bu kwa nri-ha. 5 Anēsi n'etiti madu chupu ha; Ha nētiso ha nkpu dika anētiso onye-ori. 6 N'ebe nākpata ima-jijiji nke ndagwurugwu ka ha nāghaghi ibi, Bú ọnu atùru n'ájá na n'oké nkume. 7 N'etiti umu-osisi ka ha nēti nkpu dika inyinya-ibu; N'okpuru akuba ka ha nējikọta onwe-ha. 8 Ha bu umu ndi-nzuzu, e, umu nke ndi nēnweghi aha; Apiapuwo ha n'ala. 9 Ma ub͕u a aghọwom abù ha nābù n'ikpọ ubọ-akwara, M'bu-kwa-ra ha okwu ha nēkwughari. 10 Ha nākpọm ihe-árú, ha nọ n'ebe di anya site n'ebe m'nọ, Ha eb͕ochighi kwa onwe-ha n'ibu ọnu-miri n'irum. 11 N'ihi na Ọ tọpuwo udọ̀-Ya, we wedam n'ala, Ha achipuwo kwa bridle n'irum. 12 N'aka-nrim ka ab͕ọ ahu nēbili; Ukwum abua ka ha nupuworo, We tulie uzọ nhuju-anya-ha megidem. 13 Ha emebiwo uzọm, Ha bara nmebim urù, Bú ndi nēnweghi onye nēyere ha aka. 14 Dika ọ bu na nitpú sara mbara, otú a ka ha nābia: N'okpuru ntikpọ ahu ka ha turuworo onwe-ha n'arum. 15 Ihe-egwu echighariwo imegidem, Ha nāchu ọkakam dika ifufe; Dika igwe-oji ka nzọputam gabigawo-kwa-ra. 16 Ma ub͕u a anāwusi nkpuru-obim nimem dika miri; Ubọchi nweda-n'ala nējidem. 17 N'abali ọkpukpum nēsiwasi nādapu n'arum, Ihe-nb͕u nke nārọm árú anọghi n'otù ebe. 18 Site n'iba-uba nke ike nke ọriam uwem nēnwoghari: Dika ọnu uwe-imem ka ọ nēkem buruburu. 19 Ọ tubàwom n'apiti, M'we yie ájá na ntu. 20 Anametiku Gi, ma I dighi-azam: Eguzorom ọtọ, I we lekwasim anya. 21 I nāb͕anwe iburum onye nēnweghi obi-ebere: I nēji ume aka-Gi kpab͕uem. 22 I nēbulim nye ifufe, I nēme ka o burum dika inyinya, I ne-atugharim n'elu ebili nmirì. 23 N'ihi na amawom na ọ bu ọnwu ka I gēmem ka m'chigharikuru, Ru kwa ulo nzute nke diri ihe nile di ndu. 24 N'ezie ọ bughi ihe etikpọrọ etikpọ ka Ọ gēseti aka Ya imegide; Ọ buru na ọ di n'ọdida-ya, madu gētiku Chineke n'ihi ihe ndia. 25 Àkwaghm ákwá n'ihi onye ubọchi-ya siri ike? Ò wuteghi nkpuru-obim bayere ob͕eye? 26 Mb͕e m'lere anya ezi ihe, ihe ọjọ bia-kwa-ra; M'we chere ìhè, ma ọchichiri biara. 27 Ngiri-afọm nile nāb͕o ab͕ọ, ha anọghi jū; Ubọchi nweda-n'ala nile abiawo n'irum. 28 Ejeghariwom nēji nji, ọ bughi anyanwu mere ya: Ebiliwom ọtọ nime nkpọkọta madu, tikue Chineke. 29 M'ghọworo nkita-ọhia nwa-nne, Ghọ-kwa-ra enyi-nnunu eyì. 30 Akpukpọ-arum di oji, nādapu n'arum, Ọkpukpum erewo kwa ọku site n'ikpọ-nku. 31 Ubọ-akwaram we ghọ iru-újú, Ọ̀jàm ghọ-kwa-ra olu ndi nākwa ákwá.

Job 31

1 Mu na anyam abua b͕ara ndu; M'gēsi kwa aṅa lekwasi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke anya? 2 N'ihi na gìni bu òkè nke Chineke sitere n'elu? Ma-ọbu ihe-nketa nke Onye puru ime ihe nile sitere n'ebe di elu? 3 Ọ̀ bughi nhuju-anya n'ebe onye ajọ omume nọ, Na oké ahuhu n'ebe ndi nēme ajọ ihe nọ? 4 Yà onwe-ya adighi-ahu uzọm nile, Gu kwa nzọ-ukwum nile ọnu? 5 Ọ buru na mu na ihe-efu yikọrọ jeghari, Ọ buru kwa na ukwum ab͕aso aghughọ ọsọsọ; 6 (Ka Ọ tùam n'ihe-ọtùtù ezi omume, Ka Chineke mara kwa izu-okèm; ) 7 Ọ buru na nzọ-ukwum esi n'uzọ wezuga onwe-ya, Ọ buru kwa na obim ejesowo anyam abua n'azu, Ọ buru kwa na ọlu ọ bula araparawo n'ọbu-akam abua: 8 Ka m'gha nkpuru, ma ka onye ọzọ rie; Ka eropu kwa umu nke putara n'arum. 9 Ọ buru na arafue obim ijekuru nwayi, M'we che anwu n'ọnu-uzọ madu-ibem: 10 Ka nwunyem gwere nwoke ọzọ nri, Ka ndikom ọzọ ruru kwa ala n'elu ya. 11 N'ihi na nke ahu bu nzube ọjọ; Ọzọ, nke ahu bu ajọ omume ndi-ikpe gēkpe: 12 N'ihi na ọku ka ọ bu, rue ebe-ila-n'iyì ka ọ nēripia, Ọ gēropu kwa ihe-ọmumem nile. 13 Ọ buru na ajum okwu-ikpé orùm nwoke ma-ọbu orùm nwayi, Mb͕e mu na ha nēse okwu: 14 Gini ka m'gēme kwa mb͕e Chineke nēbili? Mb͕e Ọ nēleta kwa, gini ka m'gāzaghachi Ya? 15 Ọ̀ bughi Onye ahu Nke merem nime afọ mere ya? Ọ̀ bughi otù Onye dozi-kwa-ra ayi abua nime àkpà-nwa? 16 Ọ buru na eb͕ochiem ndi nēnweghi ike n'ihe nātọ ha utọ, Ọ buru kwa na emem ka anya nwayi di-ya nwuru dala n'isi; 17 Ọ buru kwa na eriem nbì-aka-nrim, náním, Ma nwa-nb͕ei erighi nime ya; 18 (Kama site na mb͕e m'di na nwata o tozuru n'akam dika n'aka nna-ya, Ọ bu kwa site n'afọ nnem ka m'buru nwayi di-ya nwuru onye-ndú; ) 19 Ọ buru na ahum madu nāla n'iyì site n'enweghi uwe, Ọ buru kwa na ob͕eye enweghi ákwà-nb͕okwasi; 20 Ọ buru na úkwù-ya agọzighm, Ọ buru kwa na esiteghi n'aji aturum me ka aru di ya ọku; 21 Ọ buru na efewom akam megide nwa-nb͕ei, N'ihi na m'nāhu onye-iye-akam n'ọnu-uzọ-ama: 22 Ka ubum si n'azu-ubu-ya dapu, Ka etijipu kwa ogwe-akam n'ọkpukpu-ya. 23 N'ihi na nhuju-anya Chineke burum oké egwu, Site kwa na nweli-elu-Ya apughm ime ihe ọ bula. 24 Ọ buru na emewom ọla-edo ka ọ buru okwukwe efum, Ọ buru kwa na asiwom ọla-edo ọma, I bu ntukwasi-obim; 25 Ọ buru na aṅuriam ọṅu n'ihi na àkùm riri nne, Na n'ihi na akam achọtawo àkú uku; 26 Ọ buru na ajum ìhè mb͕e o nēnwu, Ma-ọbu ọnwa mara nma mb͕e ọ nāga ije; 27 Ewe rafue obim na nzuzo, Akam we sutu ọnum ọnu: 28 Nke ahu bu kwa ajọ omume ndi-ikpe gēkpe: N'ihi na n'ime ihe a m'gāgọnari Chineke Nke di n'elu. 29 Ọ buru na aǹuriam n'ọdida nke onye nākpọm asi, Ma-ọbu kpọte onwem mb͕e ihe ọjọ chọtara ya; 30 (Ma enyeghm okpo-ọnum uzọ imehieN'iji ọb͕ub͕a-iyi riọ ndu-ya; ) 31 Ọ buru na ndikom ulo-ikwūm asighi, Ọ gādi ayi nọ̄ nma ma asi na ayi ahu onye nējighi anu-ya riju afọ! 32 Ọ bughi n'èzí ka ọbìa nānọ ọnọdu-abali; Anam emeghe ọnu-uzọm n'ebe uzọ-amá di. 33 Ọ buru na ekpuchiwom njehiem nile dika Adam, N'izobe ajọ omumem n'obim, 34 N'ihi na anamama jijiji ìgwè madu bara uba, Na n'ihi na nleda-anya nke ab͕uru nile nēmem ka m'tua ujọ, M'we nọ dū, ghara isi n'ọnu-uzọ pua- 35 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na enwerem onye gēgem nti! (Le, akàràm, ka Onye puru ime ihe nile zam; )Ọ gādikwam nọ̄ nma ma asi na enwerem akwukwọ nke o deworo, bú nwoke mu na ya nēse okwu! 36 N'ezie n'ubum ka m'gēburu ya; M'gēke kwa ya n'isim dika okpu-eze. 37 M'gēgosi Ya ọnu-ọgugu nzọ-ukwum; Dika onye-ndú ka m'gābiaru Ya nso. 38 Ọ buru na alam etie nkpu megidem, Ọ buru kwa na ọ̀b͕à-ya nile akwakọ ákwá; 39 Ọ buru na eriwom ihe-ọmume-ya nēnyeghi ego, Ma-ọbu me ka ndi-nwe-ya kubìe ume-ndu-ha: 40 Ka ọhia-ogwu puta n'ọnọdu ọka wheat, Ka ahihia nēsì ísì ọjọ puta kwa n'ọnọdu ọka barley. Okwu Job agwusia.

Job 32

1 Ndikom atọ ndia we kwusi iza Job, n'ihi na ya onwe-ya bu onye ezi omume n'anya-ya. 2 Iwe Elaihu nwa Barakel, bú onye Buz, site n'ab͕uru Ram, we di ọku: megide Job ka iwe-ya di ọku, n'ihi na ọ guru onwe-ya n'onye ezi omume kari Chineke. 3 Ọzọ, megide ndi-eyì-ya atọ ka iwe-ya di ọku, n'ihi na ha achọtaghi ihe-ọziza ha gēji ma Job ikpe. 4 Ma Elaihu chere Job n'ikwu okwu, n'ihi na ndi-okenye ka ha bu kari ya onwe-ya n'ubọchi ndu-ha. 5 Elaihu we hu na ihe-ọziza adighi n'onu ndikom atọ ahu, iwe-ya we di ọku. 6 Elaihu nwa Barakel, bú onye Buz, we za, si, Nwata ka m'bu n'ubọchi ndum, ma unu onwe-unu bu ndi kara nká; N'ihi ya ka m'rapuru, we tua egwu ikwuputara unu ihe m'mara. 7 Asirim, Ubọchi bara uba gēkwu okwu, Ọtutu arọ gēme kwa ka amara amam-ihe. 8 N'ezie mọ di nime madu, Iku-ume nke Onye puru ime ihe nile nēme kwa ka ha ghọta ihe. 9 Ọ bughi ndi uku mara ihe, Ọ bughi kwa ndi-okenye nāghota ikpé. 10 N'ihi nka ka m'siri, Gem nti; M'gēkwuputa ihe m'mara, ọbuná mu onwem. 11 Le, echerem okwu-unu, Anamaṅa nti nghọta-unu, Rue mb͕e unu gēgwuputa ala okwu nile. 12 E, anamelekwasi unu anya, Ma, le, ọ dighi onye nēso Job ru uka, Ma-ọbu nke nāza okwu-ọnu-ya nile, n'etiti unu. 13 Lezienu anya ka unu ghara isi, Ayi achọtawo amam-ihe; Chineke gāchipu ya, ọ bughi madu: 14 N'ihi na o doghi okwu-ya n'usoro imegidem; M'gaghi-eji kwa okwu-ọnu-unu zaghachi ya. 15 Ha atuwo ujọ, ha azaghi kwa ọzọ: Ha ewepuwo okwu nile n'ọnu onwe-ha. 16 M'gēcheta kwa, n'ihi na ha adighi-ekwu, N'ihi na ha eguzowo, ghara iza ọzọ? 17 M'gāza òkèm, ọbuná mu onwem, M'gēkwuputa ihe m'mara, ọbuná mu onwem. 18 N'ihi na ejuputaram n'okwu; Mọ nke di n'afọm akpab͕uwom. 19 Le, afọm di ka manya-vine nke anākwupughi akwupu; Dika karama-akpukpọ ọhu, ọ nāb͕awa ab͕awa. 20 Ka m'kwue, ka aru we dajuam; M'gēmeghe eb͕ub͕ere-ọnum, za. 21 Biko, ka m'ghara ihu nwoke ọ bula iru-ọma; M'gaghi-etu kwa madu aha. 22 N'ihi na amaghm itu aha; Ọ buru otú a Onye kèrem gēbupum na nwa mb͕e ntà.

Job 33

1 Ma otú ọ di, biko, Job, nuru okwum nile, Ṅa kwa nti okwum nile. 2 Biko, le, asaghewom ọnum, Irem ekwuwo n'okpo-ọnum. 3 Okwu-ọnum nile gēkwuputa izi-ezi nke obim: Ihe eb͕ub͕ere-ọnum mara ka ha kwuworo n'idi-ọcha. 4 Mọ nke Chineke emewom, Iku-ume nke Onye puru ime ihe nile nēme kwa ka m'di ndu. 5 Ọ buru na i puru, zaghachim; Do okwu-gi n'usoro n'irum, guzo onwe-gi. 6 Le, mu onwem di ka i si di n'ebe Chineke nọ: Site n'urọ ka akpurum, ọbuná mu onwem. 7 Le, oké ujọm agaghi-eme ka i tua egwu nke-uku, Nbigide-akam agaghi-adi kwa arọ́ n'aru-gi. 8 N'ezie i kwuwo na ntim, Olu okwu nile ka m'nānu kwa, si, 9 Mu onwem di ọcha n'obi, nēnweghi njehie; Onye nācha ucha ka m'bu, ajọ omume adighi kwa nimem: 10 Le, ihe iji jum aju ka Ọ nāchọputa, Ọ nāgum n'onye-iro n'ebe Ọ nọ; 11 O nētiye ukwum abua nime ọtọsi, Nēlezi kwa okporo-uzọm nile anya. 12 Le, ọ bu na nka ka i nābughi onye ezi omume; m'gāza gi: N'ihi na Chineke di uku kari madu. 13 Gini mere i ji so Ya se okwu, Si na Ọ dighi-aza okwu bayere ihe ọ bula Ọ nēme? 14 N'ihi na otù ub͕ò ka Chineke nēkwu, E, ub͕ò abua, ma madu adighi-ariba ya ama. 15 Na nrọ, bú ọhù nke abali, Mb͕e oké ura nādakwasi madu, N'itu-òrù-ura n'elu ihe-ndina; 16 Mb͕e ahu ka Ọ nēkpughe nti madu, Nākachi kwa idọ-aka-na-nti-ha akàrà, 17 Ime ka madu si n'omume-ya wezuga onwe-ya, Na isi n'ebe onye di ike nọ kpuche npako; 18 Ọ nēb͕ochi nkpuru-obi-ya n'ida n'olùlù, Ọ nēb͕ochi kwa ndu-ya n'igabiga site n'ihe-agha. 19 Abawo-kwa-ra ya nba n'ihe-nb͕u n'elu ihe-ndina-ya, Ya na ilu-ọ̀gù nādigide adigide n'ọkpukpu-ya nile: 20 Nri we nāsọ ndu-ya oyi, Ihe-oriri nke ọ nāchọsi ike nāsọ kwa nkpuru-obi-ya oyi. 21 Anu-aru-ya nāgwusi, ewe ghara ihu ya anya; Ọkpukpu-ya nile nke anādighi-ahu anya aputawo kwa n'elu. 22 Nkpuru-obi-ya we nābiaru nso olùlù, Ndu-ya nābiaru kwa nso ndi nēme ka anwua. 23 Ọ buru na mọ-ozi anọ n'akuku ya, Bú onye-nsughari, otù onye n'etiti nnù ndi-mọ-ozi abua na ọgu iri, Igosi madu izi-ezi-ya; 24 Ọ gēme-kwa-ra ya amara, si, Dọputa ya n'irida n'olùlù, Achọtawom ihe-nb͕aputa. 25 Anu-aru-ya gādi ọhu kari nke nwataỌ nālaghachiru ubọchi okorọbia-ya: 26 Ọ nāriọ Chineke aririọ, ihe-ya we nātọ Ya utọ; O we were iti-nkpu-ọṅù hu iru-Ya: O we nyeghachi madu ezi omume-ya. 27 Ọ nābù abù n'iru madu, si, Emehiewom, me kwa ihe ziri ezi ka ọ buru ajọ omume, Ma ọ baghm n'ihe: 28 Ọ b͕aputawo nkpuru-obim n'igabiga ba n'olùlù, Ndum gēle kwa ìhè. 29 Le, ihe ndia nile ka Chineke nālu, Ub͕ò abua, ma-ọbu ub͕ò atọ, n'ebe madu nọ, 30 Ime ka nkpuru-obi-ya si n'olùlù lata, Ka ewe were ìhè nke ndu nye ya ìhè. 31 Job, ṅa nti, gem nti: B͕a nkiti, na mu onwem gēkwu. 32 Ọ buru na okwu adi n'ọnu-gi, zaghachim: Kwue, n'ihi na ọ dim utọ igu gi n'onye ezi omume. 33 Ọ buru na okwu adighi, gi onwe-gi gem nti: B͕a nkiti, na m'gēzi gi amam-ihe.

Job 34

1 Elaihu we nāza, si, 2 Ndi-amam-ihe, nurunu okwum nile; Ndi mara ihe kwa, ṅanun nti. 3 N'ihi na nti nānwa okwu nile, Okpo-ọnu nēdetu kwa ihe-oriri. 4 Ka ayi rọputara onwe-ayi ikpé: Ka ayi mara n'etiti onwe-ayi ihe di nma. 5 N'ihi na Job siri, Abum onye ezi omume, Ma Chineke ewezugawo ikpém: 6 M'gēkwu okwu-ugha megide ikpém? Ọnyá-àkum adighi ngwọta, ọ bu ezie na njehie adighi. 7 Òle madu di ka Job? Ọ nāṅu ichì-ọchì dika miri, 8 Nēso kwa ndi nālu ajọ ihe ga ije, buru onye ejikọtara ya na ha, O we so ndi nēmebi iwu jeghari. 9 N'ihi na ọ siri, Ọ dighi ihe ọ bara maduMb͕e ihe Chineke nātọ ya utọ. 10 N'ihi nka, unu ndi nwere obi, genum nti: Ya buru Chineke ihe-árú, bú imebi iwu; Ya buru kwa Onye puru ime ihe nile ihe-árú, bú ime ajọ omume. 11 N'ihi na ọlu madu ka Ọ gākwughachi ya, Na dika uzọ nwoke si di, otú a ka Ọ gēme ka ọ huta. 12 E, n'ezie, Chineke agaghi-emebi iwu, Onye puru ime ihe nile agaghi-eme kwa ka ikpé buru ajọ omume. 13 Ònye mere Ya onye-nlekọta uwa? Ma-ọbu ònye doro elu-uwa dum madu bi? 14 Ọ buru na Ọ tukwasi ya obi-Ya, Ọ buru na Ọ chikọta mọ-ya na iku-ume-ya n'ebe Ọ nọ; 15 Anu-aru nile gēkubìkọ ume, Mdu gālaghachi kwa n'ájá. 16 Ma ọ buru na i nwere nghọta, nuru nka: Ṅa nti olu okwum nile. 17 Ọzọ, onye nākpọ ezi ikpé asì, ọ̀ gāchi achi? Ma-ọbu ì gāma Onye ezi omume di ike ikpe? 18 Àgāsi eze, Gi onye jọb͕uru onwe-gi? Àgāsi ndi amara aha-ha, Unu ndi-nmebi-iwu? 19 Àgāsi kwa Ya otú a, bú Onye nādighi-ahu ndi-isi iru-ọma, Nke nādighi-amata kwa ọgaranya kari onye nēnweghi ike? N'ihi na ọlu nke aka-Ya ka ha nile bu. 20 N'otù ntabi-anya ka ha gānwu, ọbuná n'etiti abali; Anēme ka ndi ahu me nkpatu, ha nāgabiga kwa, Anēwezuga kwa onye di ike, nēweghi aka ọ bula. 21 N'ihi na anya-Ya dikwasi uzọ nile nke madu, Nzọ-ukwu-ya nile ka Ọ nāhu kwa. 22 Ọ dighi ọchichiri di, ọ dighi kwa onyinyo ọnwu di, Ebe ndi nālu ajọ ihe gēzo onwe-ha. 23 N'ihi na Ọ dighi-atukwasi madu ihe ọzọ, Ọ bu nání ijekuru Chineke n'ikpé. 24 O nētijisi ndi di ike, ma ngwuputa-ala-ya adighi, Ọ we neguzo ndi ọzọ n'ọnọdu ha. 25 N'ihi ya Ọ nāmata ọlu nile ha; O we nēkpù ha iru n'abali, ewe zọpia ha. 26 Dika ndi nēmebi iwu ka O tiworo ha akaN'ọnọdu ndi nāhu ha anya; 27 N'ihi na ha esiwo n'iso Ya wezuga onwe-ha, Ha eweghi kwa uche le uzọ-Ya nile anya: 28 Ime ka iti-nkpu nke onye nēnweghi ike biarue Ya ruo, Iti-nkpu nke ndi ewedara n'ala ka Ọ nānu kwa. 29 Mb͕e Ya onwe-ya nēme ka anọ jū, ònye gāma kwa ikpe? Mb͕e O nēzobe iru-Ya, ònye gēkiri kwa Ya? Ma ọ bu n'ebe mba nọ, ma-ọbu n'ebe madu nọ, n'otù aka ahu: 30 Ka madu emeruru emeru we ghara ibu eze, Ka ndi nēsiri ndi ahu ọnya we ghara idi. 31 N'ihi na ọ̀ di onye ọ bula siworo Chineke, Eburuwom ahuhu, m'gaghi-eme ajọ omume ọzọ: 32 Ihe m'nāhughi, Gi onwe-gi zím ya: Ọ buru na emewom ajọ omume, m'gaghi-eme kwa ya ọzọ? 33 Ọ̀ bu site n'ebe i nọ ka Ọ gākwughachi, nke i nāju ya? N'ihi na gi onwe-gi gārọputa, ọ bughi mu onwem: Ma ihe i maworo, kwue ya. 34 Madu ndi nwere obi gāsim, Ha na nwoke ọ bula mara ihe nke nēgem nti: 35 Job, ọ bughi n'ọmuma-ihe ka o nēkwu, Okwu-ya nile adighi kwa n'inwe-uche. 36 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na anwa Job rue mb͕e ebighi-ebi, N'ihi na ọ nāzaghachi dika ajọ madu. 37 N'ihi na ọ nātukwasi njehie n'elu nmehie-ya, Ọ nāku aka-ya abua n'etiti ayi, Nēme kwa ka okwu-ya ba uba megide Chineke.

Job 35

1 Elaihu we nāza, si, 2 Ọ̀ bu nka ka i nēchè na ọ bu ikpé-gi? Ma-ọbu Ì siwo, Ezi omumem kariri nke Chineke? 3 Na i nāsi, Gini ka ọ bara Gi? Ùrù gini ka ọ baram kari nmehiem? 4 Mu onwem gāzaghachi gi, Gi na ndi-eyì-gi. 5 Legide elu-igwe anya, hu; Kiri kwa mbara-ígwé nile nke di elu kari gi. 6 Ọ buru na i mehiewo, gini ka i nēmegide Ya? Ọ buru kwa na njehie-gi abawo uba, gini ka i neme Ya? 7 Ọ buru na i bu onye ezi omume, gini ka i nēnye Ya? Ma-ọbu gini ka Ọ nānara n'aka-gi? 8 Nmebi-iwu-gi gēmetu nwoke dika gi; Ezi omume-gi gēmetu kwa nwa nke madu. 9 N'ihi iba-uba nke nmeb͕u ka ha nēti nkpu; Ha nētiku onye gēyere ha aka n'ihi ogwe-aka ndi di ike. 10 Ma ọ dighi onye siri, Òle ebe Chineke nọ, bú Onye merem, Onye nēnye abù ọma n'abali; 11 Onye nēzí ayi ihe kari anu nke uwa, Ọ nēme kwa ka ayi mara ihe kari anu-ufe nke elu-igwe? 12 N'ebe ahu ka ha nēti nkpu, ma Ọ dighi-aza, N'ihi npako di ọjọ. 13 N'ezie Chineke agaghi-anu ihe-efu, Onye puru ime ihe nile agaghi-ekiri kwa ya. 14 Otú ọ di, mb͕e i nāsi na i dighi-ekiri Ya, Okwu-ikpe-gi di n'iru Ya, i gēchere kwa Ya. 15 Ma ub͕u a, n'ihi na iwe-Ya eletaghi, Na n'ihi na Ọ ribaghi njehie ama nke-uku; 16 N'ihi ya ka Job nāsaghepu ọnu-ya n'efu; Ọ bughi n'ọmuma-ihe ka O nēme ka okwu-ya nile ba uba.

Job 36

1 Elaihu we nēkwu kwa, si, 2 Cherem nwa mb͕e ntà, m'gēkwuputa-kwa-ra gi; N'ihi na okwu ọzọ di ikwuru Chineke. 3 M'gēsi n'ebe di anya bute ọmuma-ihem, Ọ bu kwa Onye kpurum ka m'gēnye ezi omume. 4 N'ihi na n'ezie ọ bughi okwu-ugha ka okwum nile bu: Onye zuru okè n'ọmuma-ihe nọyere gi. 5 Le, Chineke di ike, Ọ dighi-aju kwa onye ọ bula: Ọ di ike n'ike nke obi. 6 Ọ dighi-edebe ndu nke onye nēmebi iwu: Ma Ọ nēnye ndi ewedara n'ala ezi ikpé. 7 Ọ dighi-esepu anya-Ya n'aru onye ezi omume: Ma ọbuná n'ebe ndi-eze nọ n'oche-ezeKa Ọ nēme ka ha nọkwasi rue mb͕e ebighi-ebi, ha we di elu. 8 Ma ọ buru na ejide ha n'udọ̀ nke nweda-n'ala, Dika ndi ekeworo ab͕u nime nkpọrọ-ukwu; 9 O we nēgosi ha ọlu-ha, Na njehie nile ha, na ha nēme onwe-ha ndi di ike megide Ya. 10 O nēkpughe kwa nti-ha idọ ha aka na nti, Ọ si ha si n'ajọ ihe laghachi. 11 Ọ buru na ha anu, we fè Ya òfùfè, Ha gēme ka ubọchi nile ha gwusia n'ọdi-nma, Me kwa ka arọ nile ha gwusia n'ihe-utọ. 12 Ma ọ buru na ha adighi-anu ha gāla n'iyì site n'ihe-agha, Kubìe ume nēnweghi ọmuma-ihe. 13 Ma ndi emeruru obi-ha emeru nēdo iwe n'obi: Ha adighi-etiku Chineke mb͕e O keworo ha ab͕u. 14 Nkpuru-obi-ha nānwu na nwata, Ndu-ha nāla kwa n'iyì n'etiti ndi edoro nsọ ikwa iko. 15 Ọ nādọputa onye ewedara n'ala na nweda-n'ala-ya. Ọ nēkpughe kwa nti-ha nime nmeb͕u. 16 Ọbuná otú a ka Ọ ràraworo gi isi n'ọnu nkpab͕uBa n'ebe sara mbara, nke ebe di nkpa nādighi n'okpuru ya; Ndọba ihe-oriri nke table-gi gējuputa kwa n'abuba. 17 Ma i juputawo n'okwu-ikpé nke onye nēmebi iwu: Okwu-ikpé na ezi ikpé nējide gi. 18 N'ihi na lezie anya ka ọnuma ghara irafu gi site n'otiti-ihe; Ekwe-kwa-la ka iba-uba nke ihe-nb͕aputa wezuga gi. 19 Ọ̀ gēdo àkù-gi n'usoro ka i ghara inọ na nkpà? Ma-ọbu ume nile nke ike-gi? 20 Ekusila ume ike ibiaru abali, Bú mb͕e ndi di iche iche nārigo n'ọnọdu-ha. 21 Lezie anya, echela ajọ ihe iru: N'ihi na nka ka i rọputaworo kari nweda-n'ala. 22 Le, Chineke nēme Onwe-ya ka Ọ nọ n'elu n'ike-Ya: Ònye bu onye-ozizí dika Ya? 23 Ònye wereworo uzọ-Ya leta Ya? Ma-ọbu ònye siworo, I mewo ajọ omume? 24 Cheta ka i me ọlu-Ya ka ọ di uku, Bú nke madu bùworo abù bayere ya. 25 Madu nile elewo ya anya; Madu nēlegide ya site n'ebe di anya. 26 Le, Chineke di uku, ayi amaghi kwa Ya; Ọnu-ọgugu arọ-Ya enweghi kwa ngwuputa. 27 N'ihi na Ọ nēsepu nkpuru miri, Nke nāghọ miri-ozuzo diri alulu-Ya: 28 Nke mbara-ígwé nāwuda, nātasa madu n'uba. 29 Ọzọ, ọ̀ di onye nāghọta nb͕asa igwe-ojiNbib͕ọ nke ulo-ntu-Ya? 30 Le, Ọ b͕asawo ìhè-Ya n'elu ya; Ebe dikarisiri omimi nke oké osimiri ka O kpuchiwo-kwa-ra. 31 N'ihi na ndia ka O ji nēkpe ndi nile di iche iche ikpe; Ọ nēnye ihe-oriri n'uba. 32 Ọ jiwo ìhè kpuchi ọbu-aka-Ya abua; We nye ya iwu imegide onye nēmegide Ya. 33 Nkpọtu-ya nēgosi ihe bayere Ya, Gosi kwa anu-ulo ihe bayere Onye nārigo.

Job 37

1 Ọzọ, obim nāma jijiji bayere nka, Ọ nēme kwa nkpatu pua n'ọnọdu-ya. 2 Genu nti nke-ọma n'ime-nkpatu nke olu-Ya, Na ntamu nke nēsi n'ọnu-Ya puta. 3 N'okputu elu-igwe nile ka Ọ nēzisa ya, Ìhè-ya dikwasi kwa akuku nile nke uwa. 4 Mb͕e ọ gasiri olu nāb͕ọ uja; Ọ nēwere olu nbili-elu-Ya ma éb͕è-elu-igwe: Ọ dighi-eb͕ochi ha mb͕e anānu olu-Ya. 5 Chineke nēji olu-Ya ma éb͕è-elu-igwe n'uzọ di ebube; Ọ nēme ihe uku, ma ayi amaghi ha. 6 N'ihi na Ọ nāsi snow, Na oké miri-ozuzo, Na oké miri-ozuzo nke miri-ozuzo-Ya di ike, Di n'ala. 7 Ọ nākachi aka madu ọ bula akàra; Ka madu nile O mere we mara ya. 8 Anu-ọhia we nābà n'ọ̀té-ya, Ọ nānọdu kwa n'ebe-obibi-ya. 9 N'ime-ulo Ndida ka oké ifufe nēsi bia: Ọ bu kwa n'Ugwu ka oyi nēsi bia. 10 Anēsi n'iku-ume Chineke nye ice: Anēme kwa obosara miri ka ọ di warara. 11 Ọzọ, O nēji miri-ozuzo bob͕u oké igwe-oji; Ọ nāb͕asa igwe-oji nke ìhè-Ya: 12 Anēchighari kwa nke ahu buruburu site n'okpukpe-Ya, Ka ha we me ihe ọ bula nke Ọ nēnye ha n'iwuN'elu-uwa dum madu bi: 13 Ma ọ bu n'ihi nkpa-n'aka, ma-ọbu n'ihi uwa-Ya, Ma-ọbu n'ihi ebere, ka Ọ nēme ka ọ biarue. 14 Ṅa nti na nka, Job: Guzo, ghọta oké ọlu nile nke Chineke. 15 Ì mara otú Chineke nēnye ha iwu, Nēme kwa ka ìhè igwe-oji-Ya mua? 16 Ì mara otú oké igwe-oji ji kwuru efekefe, Oké ọlu nke Onye zuru okè n'ọmuma-ihe? 17 Gi onye uwe-gi nēkpo ọku, Mb͕e Ọ nēme ka uwa di jū site n'ifufe Ndida. 18 Ì gēso Ya me ka mbara-ígwé nile sa mbara, Nke di ike dika enyo awuru awu? 19 Me ka ayi mara ihe ayi gāsi Ya; Ayi adighi-edo okwu-ayi n'usoro n'ihi ọchichiri. 20 Àgākọrọ Ya na m'gēkwu okwu? Ma-ọbu ọ̀ di madu ọ bula siri ka eloda ya? 21 Ma ub͕u a madu ahughi ìhè nke nēb͕upu na mbara-ígwé: Ifufe we gabiga, me ka ha di ọcha. 22 N'Ugwu ka ọla-edo, bú ọmùmù-ìhè, nēsi bia: Chineke ka ebube di egwu nādikwasi. 23 Onye puru ime ihe nile, ayi achọputaghi Ya; Ọ di uku n'ike: N'ikpe na iba-uba nke ezi omume Ọ dighi-eweda n'ala. 24 N'ihi ya madu nātu egwu Ya: Ọ dighi-ahu ndi nile obi-ha mara ihe.

Job 38

1 Jehova we si n'oké ifufe za Job, si, 2 Ònye bu onye a nke nēme ka ndum-ọdu b͕a ọchichiriSite n'okwu ọmuma-ihe nādighi? 3 Biko, ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi dika onye di ike: M'gāju kwa gi, gi me kwa ka M'mara. 4 Òle ebe i nọ mb͕e M'tọro ntọ-ala uwa? Gosim, ma ọ buru na i mara nghọta. 5 Ònye doro ọtùtù-ya nile, ma asi na i mara? Ma-ọbu ònye setiri eriri-ọtùtù n'elu ya? 6 N'èlu gini ka emere ka ukwu-ya nile bamie? Ma-ọbu ònye tọb͕ọrọ nkume nkuku-ya, 7 Mb͕e kpakpando ututu nētikọ nkpu ọṅù, Umu Chineke nile we tisie nkpu ọṅù ike? 8 Ma-ọbu ònye ji ibo-ọnu-uzọ mechibido oké osimiri, Mb͕e ọ waputara dika agāsi na ọ nēsi n'àkpà-nwa puta; 9 Mb͕e M'doro igwe-oji ka ọ buru uwe-ya, Na oké ọchichiri ka ọ buru ákwà-ọkiké-ya, 10 M'we kpawara ya ókèm, Tiye ihe-ntuchi na ibo-ọnu-uzọ, 11 Si, Rue ebe a ka i gābia, ma i gaghi-agabiga ya; N'ebe a ka agākwusi kwa npako nke ebili-miri-gi nile? 12 Site na nmalite ubọchi-gi ọ̀ di mb͕e i nyere ututu iwu, Me chi-ọbubọ ka ọ mara ọnọdu-ya; 13 Ka o we jide akuku nile nke uwa aka, Ewe si nime ya rurupu ndi nēmebe iwu? 14 Ọ nāb͕anwe onwe-ya dka urọ akàrà; Ha nēguzo kwa onwe-ha dika uwe: 15 Anēb͕ochi kwa ìhè-ha n'ebe ndi nēmebi iwu nọ, Anānyaji kwa ogwe-aka di elu. 16 Ì bàwo n'ebe-nsuputa nile nke oké osimiri? Ma-ọbu ì jeghariwo n'ebe michasiri emi nke ob͕u-miri? 17 Èkpugheworo gi ọnu-uzọ-ama nile nke ọnwu? Ma-ọbu ì nāhu ọnu-uzọ-ama nke onyinyo ọnwu? 18 Ì ghọtawo rue obosara uwa? Gosim, ma ọ buru na i nazuwo ya. 19 Òle ebe ọ di, bú uzọ ebe-obibi ìhè? Ọchichiri kwa, òle ebe ọ di, bú ọnọdu-ya; 20 Nke i gēwere ya je n'ókè-ala-ya, Nke i gāghọta kwa uzọ nile nke ulo-ya? 21 I mawo, n'ihi na mb͕e ahu ka anāmu gi, Ọnu-ọgugu ubọchi-gi ri-kwa-ra nne! 22 Ì bàwo n'ulo-nkwakọba nile nke snow, Ma-ọbu ì nāhu ulo-nkwakọba nile nke ákú-miri-igwe, 23 Nke M'b͕ochiworo nye mb͕e nkpà, Nye ubọchi ọ̀gù na agha? 24 Òle ebe ọ di, bú uzọ ebe anēkesa ìhè, Ebe anāb͕asa ifufe ọwuwa-anyanwu n'elu uwa? 25 Ònye waworo uzọ-miri nye iju-miri, Ma-ọbu uzọ nye àmùmà nke éb͕è-elu-igwe; 26 Ime ka miri zokwasi ala ebe ọ dighi onye ọ bula bi; Bú ọzara madu nēbighi nime ya; 27 Ime ka afọ ju nkpọnkpọ-ebe nke tọb͕ọrọ n'efu; Na ime ka o pue, bú npuputa ọhu nke ahihia ndu? 28 Miri-ozuzo, ọ̀ nwere nna? Ma-ọbu ònye muworo nkpuru igirigi? 29 N'àfọ onye ka ice nēsi puta? Hoar-frost nke elu-igwe kwa, ònye muworo ya? 30 N'ihe dika nkume ka miri nēzobe onwe-ha, Iru ob͕u-miri nāraru kwa araru. 31 Ì nēkekọta iru-utọ Pleiades, Ma-ọbu tọsa ihe-ọdudọ nile nke Orion? 32 Ì nēme ka Mazzaroth puta na mb͕e-ya? Ma-ọbu ì nēdu Bear na umu-ya? 33 Ì mawo ukpuru nile nke elu-igwe? Ma-ọbu ì nēdo ndozi-okwu-ya n'uwa? 34 Ì nēweli olu-gi elu rue igwe-oji, Ka njubiga miri we kpuchie gi? 35 Ì nēzipu àmùmà, ka ha we je, Si kwa gi, Le ayi? 36 Ònye tiyeworo amam-ihe n'akuku di nime? Ma-ọbu ònye nyeworo akọ-na-uche nghọta? 37 Ònye nāgu mbara-ígwé ọnu site n'amam-ihe? Ma-ọbu ònye nātọb͕ọ karama-akpukpọ nile nke elu-igwe ib͕apu miri-ha, 38 Mb͕e ájá nāghọ urọ, Mb͕e ọkpurukpu-ájá nile nārapara n'aru onwe-ha? 39 Ì nāchuru nne-ọdum anu-ndọb͕u? Ma-ọbu ì nēme ka afọ-iri-nri umu-ọdum ju, 40 Mb͕e ha nāmakpu n'ebe-obibi-ha, Nọdu kwa n'okwu-ọhia iche anu? 41 Ònye nēdoziri ugolo-ọma ihe-oriri-ya, Mb͕e umu-ya nētiku Chineke, Nāwaghari nēnweghi ihe-oriri?

Job 39

1 Ì mawo mb͕e ewu-ọhia nke nkume di elu ji amu nwa? Ì nāriba ama mb͕e nne-ele nāmuputa nwa? 2 Ì nāgu ọnwa ha nọzuru n'imu nwa ọnu? Ma-ọbu ì mawo mb͕e ha ji amu nwa? 3 Ha nēruru ala, muputa umu-ha, Tuzuga ihe-nb͕u-ha. 4 Aru nāma umu-ha nma, ha nētolite n'ọhia; Ha nāpu, ha adighi-alaghachikute kwa ha. 5 Ònye zipuworo inyinya-ibu-ọhia ka o nwere onwe-ya? Ma-ọbu ònye tọpuworo ab͕u inyinya-ibu-ọhia? 6 Nke M'meworo ala ihe nādighi ka ọ buru ulo-ya, Me kwa ala bu nnú nnú ka ọ buru ebe-obibi-ya. 7 Ọ nāchì ùzù obodo ọchì, Ọ dighi-anu nbib͕o nke onye nāchi madu n'ihe-ike. 8 Ebe-nleputa nke ugwu bu ebe ọ nāzù onwe-ya, Akwukwọ ndu ọ bula ka ọ nāchọ. 9 Àtu gēkwe ibu orù-gi? Ma-ọbu ọ̀ gānọ ọnọdu-abali n'akuku ebe i nāzù anu-ulo-gi? 10 Ì gēji udọ̀-ya libe atu n'ihe-ọlu n'ọ̀b͕à ala-ubi? Ma-ọbu ò gēso gi me ndagwurugwu ka ha di lari? 11 Ì gātukwasi ya obi n'ihi na ike-ya riri nne? Ma-ọbu ì gārapuru ya ndọb͕u i nādọb͕u onwe-gi n'ọlu? 12 Ì gēkwere na ya, na ọ gēbulata nkpuru-ọghigha-gi, Chikọta ọka nke ebe-nzọcha-ọka-gi? 13 Nkù nke enyi-nnunu nāṅuri ọṅu; Ma nkù-ya na ábúbà-ya, hà di ebere? 14 N'ihi na ọ nārapu àkwá-ya n'ala, Nēme ka ha kpo ọku n'elu ájá, 15 O we chezọ na ukwu gāzọpia ha, Ma-ọbu na anu-ọhia gāzọkwasi ha ukwu. 16 O mewo umu-ya ihe-ike, dika agāsi na ha abughi ihe o nwere: Ọ bu n'efu ka ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu bu, ma ọ tughi egwu; 17 N'ihi na Chineke emewo ya ka o chezọ amam-ihe, O kèghi kwa ya òkè nime nghọta. 18 Na mb͕e o ji seti onwe-ya n'elu ib͕a ọsọ, Ọ nāchì inyinya, nāchì kwa onye ọ nēbu, ọchì. 19 Ì nēnye inyinya idi-ike-ya? Ì nēyikwasi olu-ya ọzà nēme nkpatu? 20 Ì nēme ya ka ọ kwua ǹtù dika igurube? Ebube nke imapu-imi-ya di oké ujọ. 21 Ọ nābọ ukwu na ndagwurugwu, obi nātọ kwa ya utọ n'ike-ya: Ọ nāpu izute ihe-agha. 22 Ọ nāchì oké egwu ọchì, ma ọ dighi-atu ujọ; Ọ dighi-esi kwa n'iru mma-agha chighari azu. 23 Àkpà-àkú nēkwu wọghiri wọghiri n'elu ya, Ya na ob͕ub͕u-àmùmà nke ube, na arua. 24 Nime nmali-elu-ya na ime-nkpatu-ya o nēloda ala; Ọ dighi-ekwe kwa na ọ bu olu opi-ike. 25 Mb͕e ọ bula opi-ike ji adà udà ọ si, Ehe! Ọ bu kwa site n'ebe di anya ka ọ nānu ísì agha, Na éb͕è-elu-igwe, bú nbib͕ọ ndi-ọchi-gha, na iti-nkpu. 26 Ọ̀ bu site na nghọta-gi ka eb͕é nēfego n'elu, B͕asa kwa nkù-ya n'ebe Ndida di? 27 Ọ̀ bu n'okwu-ọnu-gi ka ugo nēfeli elu, Ma-ọbu me akwu-ya ka ọ di elu? 28 N'elu nkume di elu ka o nēbi, nọ kwa ọnọdu-abali, N'elu ọnu nkume di elu na ebe ewusiri ike. 29 Site n'ebe ahu ka o nyoputaworo ihe-oriri; Anya-ya abua nēsi n'ebe di anya legide ya. 30 Umu-ya nāmicha kwa ọbara: Ọzọ, ebe ndi eb͕uru eb͕u di, n'ebe ahu ka ọ nọ.

Job 40

1 Jehova we za Job, si, 2 Onye nādọ aka na nti, ọ̀ nālusoOnye puru ime ihe nile ọ̀gù? Onye nābara Chineke nba, ya za ya. 3 Job we za Jehova, si, 4 Le, abum onye elelìworo; gini ka m'gāzaghachi Gi? Atukwasiwom, akam, n'ọnum. 5 Otù ub͕ò ka m'kwuworo okwu, m'gaghi-aza kwa; E, ub͕ò abua, ma m'gaghi-aza kwa ọzọ. 6 Jehova we si n'oké ifufe za Job, si, 7 Biko, ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi dika onye di ike: M'gāju gi, gi me kwa ka M'mara. 8 Ì nēmebi kwa ikpém? I nāmam ikpe, ka i we buru onye ezi omume? 9 Ma-ọbu ọ̀ bu ogwe-aka dika Chineke ka i nwere? Ọ̀ bu kwa olu dika Ya ka i gēji ma dika éb͕è-elu-igwe? 10 Biko, were nbili-elu na idi-elu chọ onwe-gi nma; Were kwa ebube na ima-nma yikwasi onwe-gi. 11 Wusa nrubiga-ókè nke iwe-gi: Hu kwa onye-npako ọ bula, me ka ọ di ala. 12 Hu onye-npako ọ bula, me ka o ruru ala; Zọpia kwa ndi nēmebi iwu n'ọnọdu-ha. 13 Zobekọ ha n'ájá; Kechie iru-ha n'ebe zoro ezo. 14 Emesia Mu onwem gēkele kwa gi, Si na aka-nri-gi nāzọputa gi. 15 Biko, le otobo, nke M'kèworo gi na ya; Ọ nāta ahihia dika ehi. 16 Biko, le, ike-ya di n'úkwù-ya, Ume-ya di kwa n'akwara nile nke afọ-ya. 17 Ọ nārọgọba ọdùdù-ya dika osisi cedar: Akpọwo akwara utaku-ukwu-ya. 18 Ọkpukpu-ya nile di ka ogidi ọla nwere umi; Ọgiriga-ya di ka nkpọro ígwè. 19 Ya onwe-ya bu nmalite uzọ nile nke Chineke: Onye meworo ya nēweta mma-agha-ya nso. 20 N'ezie ihe-ọmume ka ugwu nēbutere ya; Bú ebe anu-ọhia nile nēgwuli egwú. 21 N'okpuru osisi lotus ka ọ nēdina, N'ebe nzuzo nke amì, na apiti. 22 Osisi lotus nēji ǹdò-ha b͕ochie ya; Osisi willow nke miri-iyi di ya buruburu. 23 Le, osimiri nērùsi ike, ọ dighi-ama jijiji: Ọ nātukwasi obi, mb͕e Jọdan nāwaputa rue ọnu-ya. 24 Ànējide ya mb͕e ọ nēle anya? Ma-ọbu ànēwere ọnyà mapue imi-ya?

Job 41

1 Ì gēji nkò-azù dọrọ oké agu-iyi? Ma-ọbu ì gēji ndọ̀ biada ire-ya? 2 Ì gētiye udọ̀-ami n'imi-ya? Ma-ọbu i gēji ngu ígwè dupue àb͕à-ya? 3 Ọ̀ gāriọ gi ọtutu aririọ-amara? Ma-ọbu ọ̀ gāgwa gi okwu di nrò? 4 Ò gēso gi b͕a ndu? Ì gēwere ya ka ọ buru orù rue mb͕e ebighi-ebi? 5 Ì gēji ya gwu egwú dika nnunu? Ma-ọbu ì gēke ya ab͕u nye umu-ab͕ọghọ-gi? 6 Òtù ndi-azù, hà gēji ya zu ahia? Hà gēkè ya n'etiti ndi-ahia? 7 Ì gēji ígwè ebiri nkò maju akpukpọ-aru-ya? Ma-ọbu ì gēji ube-azù maju isi-ya? 8 Tukwasi ya ọbu-aka-gi; Cheta agha, eme-kwa-la ya ọzọ. 9 Le, nchere-ya bu ihe-ugha: Àdighi-atuda madu ọbuná n'ile ya anya? 10 Ọ dighi onye di irè nke ikpọte ya: Ònye kwa bu onye ahu nke gēguzo onwe-ya n'irum? 11 Ònye buru uzọ nyem, nke M'gākwughachi? Ihe ọ bula nke di n'okpuru elu-igwe nile, nkem ka ọ bu. 12 M'gaghi-ab͕a nkiti bayere ihe nile di ya n'aru, Ma-ọbu okwu nke idi-ike-ya, ma-ọbu ima-nma nke odudo-n'usoro-ya. 13 Ònye kpugheworo iru uwe-ya? Ònye gābà n'ab͕a-ya apiajiri okpùkpù abua? 14 Ònye gēmeghe uzọ nke iru-ya? Ezé-ya di oké ujọ buruburu. 15 Usoro nke ọta azu-ya bu npako-ya, Ha bu ihe emechiri emechi dika agāsi na eji ihe-akàrà siri ike mechi ya. 16 Dika otù si nọ ibe-ya nso, Ifufe adighi-abà n'etiti ha. 17 Anēme ka otù rapara n'aru nwa-nne-ya; Ha nējisi onwe-ha ike, agaghi-ekesa kwa ha. 18 Ize-uzere-ya nēme ka ìhè nēb͕upu, Anya-ya abua di ka mbubere-anya nke chi-ọbubọ. 19 N'ọnu-ya ka ọku-ọwa nāputa, Icheku-ọku nēwepuga kwa onwe-ha. 20 N'oghere-imi-ya abua ka anwuru-ọku nāputa, Dika nke ite anāfunwu ọku na amì nēre ere. 21 Iku-ume-ya nāmunye icheku, Ire-ọku nēsi kwa n'ọnu-ya puta. 22 N'olu-ya ka ike nwere ọnọdu-ya, Ọ bu kwa n'iru ya ka obi-ilọ-miri nēte egwú. 23 Ibewa urù anu-aru-ya rapara n'aru onwe-ha: O siri ike n'aru ya; agaghi-emeghari ya. 24 Obi-ya siri ike dika nkume; O si-kwa-ra ike dika nne-nkume-igwe-nri. 25 Mb͕e o nēbuli onwe-ya ndi di ike nātu ujọ: Site n'imebi-obi ha nēsihie uzọ. 26 Ọ buru na madu ewere mma-agha biakwasi ya, mma-agha ahu adighi-eguzosi ike; Ya na ube, na àkú, na uwe-agha. 27 Ọ nāgu ígwè n'okporo-ọka, Nāgu kwa ọla n'osisi rere ure. 28 Àkú adighi-eme ka ọ b͕alaga: Nkume èbè ab͕anweworo ya ahihia-ọka. 29 Anāgu ndele n'ahihia-ọka: Ọ nāchì kwa nkpọtu arua ọchì. 30 Okpuru-ya di ka ejùjù di nkọ: Ọ nāb͕asa dika ọ bu ihe isucha ọka n'elu apiti. 31 Ọ nēme miri di omimi ka ọ b͕ọ dika ite: Ọ nēme oké osimiri ka ọ di ka manu-otite nēsì ísì utọ. 32 Ọ nēme uzọ ka ọ nēnwuso ya; Madu gēchè na ob͕u-miri nwere isi-awọ. 33 Ọ dighi nke di ka ya n'elu ájá uwa, Nke emeworo nēnweghi ujọ. 34 Ihe nile nke di elu ka ọ nāhu: Ya onwe-ya bu eze anu-ọhia nile di nganga.

Job 42

1 Job we za Jehova, si, 2 Amawom na I puru ime ihe nile, Amawokwam na adighi-eb͕ochi nzube ọ bula nke sitere na Gi. 3 Ònye bu onye a nke nēzobe ndum-ọdu n'enweghi ọmuma-ihe? N'ihi ya ka m'gosiworo ihe nke m'nādighi-aghọta, Ihe dikaririm ebube, nke m'nādighi-amata. 4 Biko, nuru, mu onwem gēkwu kwa; M'gāju Gi, Gi me kwa ka m'mara. 5 Site n'ọnunu nti ka m'nuru Gi; Ma ub͕u a anyam ahuwo Gi. 6 N'ihi nka ka m'nāju onwem aju, we chèghariaN'elu ájá na ntu. 7 O rue, mb͕e Jehova gwasiri Job okwu ndia, na Jehova siri Elifaz, bú onye Timan, Iwem di ọku megide gi, megide kwa ndi-eyì-gi abua: n'ihi na unu ekwughi ihe ziri ezi bayerem, dika orùm, bú Job, kwuworo. 8 Ma ub͕u a, chirinu n'onwe-unu oke-ehi asa na ebulu asa, jekuru orùm, bú Job, surere onwe-unu àjà-nsure-ọku; Job, bú orùm, gēkpe kwa ekpere bayere unu; n'ihi na n'ezie ọ bu ya ka M'gāhu iru-ọma, ka M'ghara imeso unu dika nzuzu-unu si di; n'ihi na unu ekwughi ihe ziri ezi bayerem, dika orùm, bú Job, kwuru. 9 Elifaz, bú onye Timan, na Bildad, bú onye Shua, na Zofa, bú onye Neama, we je, me dika Jehova gwara ha: Jehova we hu Job iru-ọma. 10 Jehova me-kwa-ra ka ndọta-n'agha Job lata, mb͕e o kpere ekpere bayere ndi-eyì-ya: Jehova we tukwasi n'ihe nile Job nwere okpùkpù abua. 11 Umu-nne-ya ndikom nile, na umu-nne-ya ndinyom nile, na ndi nile mara ya na mb͕e gara aga, we biakute ya, so ya rie nri n'ulo-ya: ha we gosi ya ebere ha ji n'aru ya, kasi kwa ya obi bayere ihe ọjọ ahu nile nke Jehova mere ka ọ biakwasi ya: ha we nye ya, nwoke ọ bula otù iberibe ego, na nwoke ọ bula otù nb͕a-aka ọla-edo. 12 Ọzọ, Jehova gọziri ikpe-zu Job kari nmalite-ya, o we nwe orú nnù ewu na aturu na nnù iri-na-ise, na nnù camel iri-na-ise, na nnù ehi ise ejikọrọ abua abua, na nnù nne-inyinya-ibu abua na ọgu iri. 13 O nwe-kwa-ra umu-ndikom asa na umu-ndinyom atọ. 14 O we kpọ aha nwayi mbu, Jemaima; na aha nwayi nke-abua, Kezaia; na aha nwayi nke-atọ, Keren-hapuk. 15 Ma ahughi ndinyom, mara nma dika umu-ndinyom Job n'ala ahu nile: nna-ha we nye ha ihe-nketa n'etiti umu-nne-ha ndikom. 16 Job we di ndu mb͕e ihe a gasiri ọgu arọ asa, o we hu umu-ya, na umu umu-ya, bú ọb͕ọ anọ. 17 Job we nwua, buru agadi, ubọchi ndu-ya ju-kwa-ra ya afọ.

Abù Ọma 1

1 Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu nke nējeghi ije na ndumọdu ndi nēmebi iwu, Nke nēguzoghi kwa n'uzọ ndi nmehie, Nke nānọghi kwa n'ọnọdu ndi nākwa emò. 2 Kama n'iwu Jehova ka ihe-utọ-ya di; Ọ bu kwa n'iwu-Ya ka ọ nātughari uche ehihie na abali. 3 Ọ gādi kwa ka osisi akuworo n'akuku iyi juputara na miri, Nke nāmi nkpuru-ya na mb͕e-ya, Ọzọ, akwukwọ-ya adighi-akpọnwu; Ihe ọ bula kwa nke ọ nēme, ọ nēme ka ọ ga nke-ọma. 4 Ọ bughi otú a ka ndi nēmebi iwu di; Kama ha di ka ib͕ob͕o-ọka nke ifufe nēfesa. 5 N'ihi nka ndi nēmebi iwu agaghi-eguzosi ike n'ikpé, Ndi-nmehie agaghi-eguzosi kwa ike na nzukọ ndi ezi omume. 6 N'ihi na Jehova mara uzọ ndi ezi omume: Ma uzọ ndi nēmebi iwu gāla n'iyì.

Abù Ọma 2

1 N'ìhi gini ka mba nile meworo oké nkpọtu? N'ìhi gini ka ndi nile di n'uwa nātughari ihe-efu n'uche? 2 Ndi-eze nke uwa nēguzo onwe-ha, Ndi-isi nāb͕akọta kwa ìzù, Imegide Jehova, na imegide onye-Ya etere manu, si, 3 Ka ayi tijie ab͕u nile ha, Tufue udọ̀ nile ha n'aru ayi. 4 Onye nānọdu n'elu-igwe nāchi ọchì: Onye-nwe-ayi nākwa ha emò. 5 Mb͕e ahu Ọ gāgwa ha okwu n'iwe-Ya, Ọ bu kwa n'iwe-Ya di ọku ka Ọ gēme ka ha ma jijiji: 6 Ma Mu onwem emewo ka ezem guzosie ikeN'elu Zaion, bú ugwu nsọm. 7 M'gākọ akukọ bayere ukpuru: Jeohva sirim, Ọkparam ka gi onwe-gi bu; Mu onwem amuwo gi ta. 8 Riọm, na agamenye gi mba nile ka ha buru ihe-nketa-gi, Na nsọtu uwa ka ha buru ihe-onwunwe-gi. 9 I gēji nkpa-n'aka ígwè tijisi ha; Dika ihe ọkpu-ite kpuru ka agātupia ha. 10 Ma ub͕u a, ndi-eze, nwenu uche: Ka adọ unu aka na nti, ndi-ikpe nke uwa. 11 Werenu egwu fè Jehova òfùfè, Were-kwa-nu ọma-jijiji tegharia egwú ọṅù. 12 Sutunu onye arọputaworo ọnu, ka ọ ghara iwe iwe, unu we la n'iyì n'uzo, N'ihi na iwe-ya gēre ọku na mb͕e ntà. Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ha bu, bú ndi nile nāb͕abà nime ya.

Abù Ọma 3

1 Jehova, le otú ndi nākpab͕um bara uba! Ọtutu madu nēbili imegidem. 2 Ọtutu madu nēkwu okwu bayere nkpuru-obim, si, Ọ dighi nzọputa diri ya nime Chineke. 3 Ma Gi onwe-gi, Jehova, bu ọta buruburum, Na nsọpurum, na onye nēbuli isim elu. 4 Ejim olum kpọkue Jehova, O we zam site n'ugwu nsọ Ya. 5 Mu onwem dinara ala, raru ura; Etetaram; n'ihi na Jehova nākwagidem. 6 M'gaghi-atu egwu ìgwè ndi nkem anāpughi iguta aguta, Ndi doworo onwe-ha imegidem buruburu. 7 Bilie, Jehova; zọputam, Chinekem: N'ihi na I tiwo ndi-irom nile ihe na ǹtì; I tipiawo ezé ndi nēmebi iwu. 8 Jehova nwe nzọputa: Ka ngọzi-Gi dikwasi ndi-Gi. Selah

Abù Ọma 4

1 Mb͕e m'kpọrọ, Gi zam, Chineke nke ezi omumem; I nyewom ebe sara mbara mb͕e m'nọ na nkpà: Merem amara, nuru ekperem. 2 Umu madu, rùe ole mb͕e ka nsọpurum gāghọ itiye n'ọnọdu-ihere? Unu nāhu ihe-efu n'anya, nāchọ okwu-ugha. 3 Ma maranu na Jehova ekewaputaworo Onwe-ya onye-ebere: Jehova nānu mb͕e m'kpọkuru Ya. 4 Manu jijiji, emehie-kwa-la: Sinu otú a n'obi-unu n'elu ihe-ndina-unu, we dere du. Selah 5 Chuanu àjà ezi omume, Tukwasi-kwa-nu obi na Jehova. 6 Ọtutu madu nāsi, Ònye gēme ka ayi hu ọdi-nma? Jehova, bulie ìhè iru-Gi ka ọ mukwasi ayi. 7 I tiyewo ọṅù n'obim, Kari nke ha nwere na mb͕e ọka-ha na manya-vine ọhu ha ji aba uba. 8 N'udo ka m'gēji otù mb͕e ahu dina ala, raru ura: N'ihi na Gi onwe-gi, Jehova, nání Gi, nēme ka m'biri na ntukwasi-obi.

Abù Ọma 5

1 Ge nti n'okwu-ọnum, Jehova, Ghọta ntughari-uchem. 2 Ṅa nti n'olu ntiku m'nētiku Gi, Ezem, na Chinekem: N'ihi na ọ bu Gi ka m'nēkpere. 3 Jehova, n'ututu ka I gānu olum; N'ututu ka m'gēdoro Gi ekperem n'usoro, che kwa nche. 4 N'ihi na ọ bughi Chineke nke nmebi-iwu nātọ utọ ka I bu: Ihe ọjọ agaghi-anọ dika ọbia n'ebe I nọ. 5 Ndi nānya isi agaghi-eguzo onwe-ha n'anya-Gi: I kpọrọ ndi nile nālu ajọ ihe asì. 6 I gēme ka ndi nile nēkwu okwu-ugha la n'iyì: Madu nke bu onye-ọbara na onye- aghughọ, Jehova nākpọ ya onye-árú. 7 Ma mu onwem, n'uba nke ebere-Gi ka m'gābà n'ulo-Gi: M'gākpọ isi ala n'ebe ulo uku nsọ Gi di n'egwu-Gi. 8 Jehova, dubem n'ezi omume-Gi n'ihi ndi nēchem anwu; Me ka uzọ-Gi zie ezi n'irum. 9 N'ihi na ọ dighi ihe nke nēguzosi ike di n'ọnu-ya; Ime-ha bu ila-n'iyì nile: Ílì ghere oghe ka akpiri-ha bu; Ha nēkwu okwu ire-utọ. 10 Ma ha ikpe, Chineke; Ka ha da ada site na ndum-ọdu nile ha: N'uba nke njehie nile ha nupu ha; N'ihi na ha anupuwo isi imegide Gi. 11 Ma ka ndi nile ndi nābabà nime Gi ṅuria, Ka ha tie nkpu ọṅù rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi na I nēkpuchi ha ǹdò: Ọzọ, ka obi nke ndi nāhu aha-Gi n'anya tọ ha utọ nime Gi. 12 N'ihi na Gi onwe-gi nāgọzi onye ezi omume; Jehova, I ji otú ihe-ya si atọ Gi utọ b͕a ya buruburu dika ọta uku.

Abù Ọma 6

1 Jehova, Abalaram nba n'iwe-Gi, Adọ-kwa-lam aka na nti n'ọnuma-Gi. 2 Merem amara, Jehova; n'ihi na onye taworo aru ka m'bu: Mem ka m'diri ndu, Jehova; n'ihi na ọkpukpum nile nāma jijiji. 3 Nkpuru-obim nāma kwa jijiji nke-uku: Ma Gi onwe-gi, Jehova, rùe ole mb͕e? 4 Lata, Jehova, dọputa nkpuru-obim: Zọputam n'ihi ebere-Gi. 5 N'ihi na ọ dighi ncheta-Gi di n'ọnwu: Nime ala-mọ ònye gēkele Gi? 6 Adọb͕uwom onwem n'ọlu n'ize-umem; Kwa-abali ka m'nēme ka ihe-ndinam se n'elu anya-mirim; Ejim anya-mirim de ihe m'ji edina. 7 Anyam emebiwo site na nkpasu-iwem dika uwe nla mebiri; Ọ kawo nká n'hi ndi-nkpab͕um nile. 8 Si n'ebe m'nọ wezuga onwe-unu, unu nile ndi nālu ajọ ihe; N'ihi na Jehova anuwo olu ákwám. 9 Jehova anuwo arirọ-amaram; Jehova gānara ekperem. 10 Ihere gēme ndi-irom nile, ha gāma kwa jijiji nke-uku: Ha gālaghachi azu, ihere gēme ha na mberede.

Abù Ọma 7

1 Jehova, bú Chinekem, na Gi ka m'b͕abàworo: Zọputam n'aka ndi nile nēsob͕um, naputakwam n'aka-ha: 2 Ka ọ ghara idọka nkpuru-obim dika ọdum, Nētipia ya, mb͕e onye-nnaputa adighi. 3 Jehova, bú Chinekem, ọ buru na emewom nka; Ọ buru na ajọ omume di n'ọbu-akam abua; 4 Ọ buru na enyeghachiwom onye mu na ya di n'udo ihe ọjọ; (Kama nke ahu, adọputawom onye nākpab͕um n'efu: ) 5 Ka onye-iro chua mkpuru-obim, rue ya aru; Ka ọ zọda kwa ndum n'ala, Me ka nsọpurum biri n'ájá. Selah 6 Bilie, Jehova, n'iwe-Gi, Welie Onwe-gi elu imegide nrubiga-ókè-iwe nke ndi nākpab͕um: Teta-kwa-ram; I nyewo ikpé iwu. 7 Ka nzukọ nke ndi nile di n'uwa di kwa Gi buruburu: Gi laghachi kwa n'ebe di elu n'elu ya. 8 Jehova nēkpe ndi nile di iche iche ikpe: Kpem ikpe, Jehova, dika ezi omumem si di, na dika izu-okèm si di nke di nimem. 9 Biko, kwe ka ihe ọjọ nke ndi nēmebi iwu gwusia, ma me ka onye ezi omume guzosie ike: N'ihi na onye nānwa obi nile na akuru nile ka Chineke, bú Onye ezi omume, bu. 10 Ọtam dikwasi na Chineke, Bú Onye nāzọputa ndi obi-ha ziri ezi. 11 Chineke bu onye-ikpe nēme ezi omume, Ọ bu kwa Chineke nke nēwe iwe kwa-ubọchi. 12 Ọ buru na madu echigharighi, Ọ gāmu mma-agha-Ya ka ọ di nkọ; Ọ zọwo uta-Ya ukwu ikwe ya, dozie ya ib͕a. 13 Ọ bu kwa imegide ya ka O doziworo ihe nile nke ọnwu; Ọ nēme àkú-Ya ka ha buru ihe nēre ọku. 14 Le, ime ajọ ihe nēme ya; Ọ turuwo kwa ime nmeb͕u, muputa okwu-ugha. 15 Olùlù ka o gwuworo, gwuputa ya, O we da n'ebe-nbibi nke ọ nēme. 16 Nmeb͕u-ya gābiaghachi n'isi-ya, Ọ bu kwa n'opu-n'isi-ya ka ihe-ike-ya gāridakwasi. 17 M'gēkele Jehova dika ezi omume-Ya si di: M'gābùku kwa aha Jehova, bu Onye kachasi ihe nile elu, abù ọma.

Abù Ọma 8

1 Jehova, Onye-nwe-ayi, Le otú aha-Gi di ebube n'uwa nile! Gi Onye tiyeworo ebube-Gi n'elu ígwé. 2 I siwo n'ọnu umu-ntakiri na umu nāṅu ara tọ ntọ-ala ike, N'ihi ndi-nkpab͕u-Gi, Ime ka onye-iro na onye nābọ̀ ọ́bọ̀ kwusi. 3 Mb͕e m'huru elu-igwe-Gi, bú ọlu nkpisi-aka-Gi, Ọnwa na kpakpando nile, nke I doziworo; 4 Gini ka madu bu, na I nēcheta ya; Na nwa nke madu, na I nēleta ya? 5 I we me ya ka ọ fọduru ya nke-ntà ibu Chineke, I ji kwa nsọpuru na ima-nma kpube ya n'isi dika okpu-eze. 6 I nēme ya ka ọ nāchi ọlu nile nke aka-Gi abua; Ihe nile ka I doro n'okpuru ukwu-ya abua: 7 Ewu na aturu na ehi, ha nile, Ha na anu ọhia; 8 Nnunu elu-igwe, na azù nile nke oké osimiri, Bú ihe nke nāgabiga n'uzọ nile nke oké osimiri nile. 9 Jehova, Onye-nwe-ayi, Le otú aha-Gi di ebube n'uwa nile!

Abù Ọma 9

1 M'gēji obim nile kele Jehova; M'gākọ kwa akukọ oké ọlu-Gi nile. 2 M'gāṅuri ọṅu, obim gātọkwam utọ, nime Gi: M'gābùku aha-Gi abù ọma, Gi Onye kachasi ihe nile elu; 3 Mb͕e ndi-irom laghachiri azu, Su ngọngọ, si kwa n'iru Gi la n'iyì. 4 N'ihi na I kpewo ikpem ziri ezi na okwu-ikpem; I nọduru n'oche-eze, buru onye-ikpe nēme ezi omume. 5 I basiwo mba nile ọzọ nba, I mewo ka ndi nēmebi iwu la n'iyì, I hichapuwo aha-ha rue mb͕e nile ebighi-ebi. 6 Ndi-iro agwusiwo, ha bu nkpọnkpọ ebe rue mb͕e ebighi-ebi; Ọzọ, obodo nile nke I ropuworo, Ncheta-ha, ọbuná nke obodo ahu, alawo n'yì. 7 Ma Jehova nānọdu dika eze rue mb͕e ebighi-ebi: O doziwo oche-eze-Ya ikpe ikpe. 8 Ya onwe-ya gēkpe uwa dum madu bi ikpe n'ezi omume, Ọ gēkpe ndi nile di n'uwa ikpe n'izi-ezi. 9 Jehova bu-kwa-ra onye anāzọpia ulo-elu, Bú ulo-elu nke diri mb͕e nile nke nkpà; 10 Ọzọ, ndi mara aha-Gi gātukwasi Gi obi; N'ihi na I rapughi ndi nāchọ Gi, Jehova. 11 Bùkuenu Jehova abù ọma, bú Onye bi na Zaion: Gosinu omume-Ya nile n'etiti ndi nile di iche iche. 12 N'ihi na Onye nājuta ọbara ndi eb͕uru eb͕u echetawo ha: O chezọghi iti-nkpu nke ndi ewedara n'ala. 13 Merem amara, Jehova; Hu nweda-n'alam nke sitere n'aka ndi nākpọm asì, Gi Onye nēbulim elu site n'ọnu-uzọ-ama ọnwu; 14 Ka m'we kọ akukọ otuto-Gi nile: N'ọnu-uzọ-ama nile nke ada Zaion, Ka m'ṅuria ọṅu na nzọputa-Gi. 15 Mba nile ọzọ emikpuwo n'olùlù ha mere: N'ub͕u nke ha zobere ka anānwude ukwu-ha. 16 Jehova emewo ka amara Ya onwe-ya, ezi ikpe ka O kpeworo: N'ọlu nke ọbu-aka-ya abua ka amaworo onye nēmebi iwu dika n'ọnyà. Higgaion. Selah 17 Ndi nēmebi iwu gālaghachi n'ala mọ, Bú mba nile ndi nēchezo Chineke. 18 N'ihi na ọ bughi rue mb͕e ebighi-ebi ka agēchezọ ob͕eye, Olile-anya nke ndi di ume-ala n'obi agaghi-ala n'iyì rue mb͕e ebighi-ebi. 19 Bilie, Jehova; ekwela ka madu di ike: Ka ekpe mba nile ikpe n'iru Gi. 20 Jehova, doro ha ihe-egwu: Ka mba nile mara na nání madu ka ha bu. Selah

Abù Ọma 10

1 Jehova, n'ìhi gini ka I nēguzo nēbe di anya? N'ìhi gini ka I nēzobe Onwe-gi na mb͕e nile nke nkpà? 2 Site na npako nke onye nēmebi iwu ka anāchu onye ewedara n'ala ọku ọku; Anējide ha na nzube nile nke ha chère. 3 N'ihi na onye nēmebi iwu anyawo isi n'ihe nkpuru-obi-ya nāchọsi ike, Onye nērita urù nēzighi ezi ka ọ gọziwo-kwa-ra, o lelìwo Jehova. 4 Onye nēmebi iwu, ka imi-ya si di elu, nāsi, Ọ dighi ajuju Ọ gāju. Nzube-ya nile nāsi, ọ dighi Chineke ọ bula di. 5 Uzọ-ya nile di ike na mb͕e nile; Ikpé-Gi nile di n'ebe di elu kari èbe anya-ya gēru: Ndi nile nākpab͕u ya, ọ nāpù megide ha na nleli. 6 o siwo n'obi-ya, Agaghi-ewezugam n'ọnọdum: Rue ọb͕ọ nile ọ dighi mb͕e m'gānọ n'ọdi-njọ. 7 Ọnu-ya juputara n'ọb͕ub͕a-iyi na aghughọ na mmegbu: N'okpuru ire-ya ka nmeb͕u na ajọ ihe di. 8 Ọ nānọdu n'ebe iche-anwu nke obodo ntà nile: N'ebe-nzuzo nile ka ọ nēb͕u onye nēmeghi ihe ọjọ: Anya-ya abua nēwere nzuzo nyogide onye nāhuju anya. 9 Ọ neche anwu n'ebe-nzuzo dika ọdum n'okwu-ọhia-ya: Ọ nēche anwu inwude onye ewedara n'ala: Ọ na-anwude onye ewedara n'ala, mb͕e ọ dọbatara ya n'ub͕u-ya. 10 Anāzọpia ya, ọ nāmakpu amakpu, Ndi nāhuju anya adawo kwa n'ala site n'aka ndi-ya nwere ume. 11 Ọ siwo n'obi-ya, Chineke echezọwo: O zobewo iru-Ya; ọ dighi mb͕e Ọ huru ya. 12 Bilie, Jehova; Chineke, welie aka-Gi elu: Echezọla ndi ewedara n'ala. 13 N'ìhi gini ka onye nēmebi iwu lelìworo Chineke? Ọ siwo n'obi-ya, I gaghi-aju ajuju. 14 I huwo ya; n'ihi na Gi onwe-gi nēlegide nmeb͕u na nkpasu-iwe, itiye ya n'aka-Gi: N'aka-Gi ka onye nāhuju anya nārapu onwe-ya; Onye nēyere nwa-nb͕ei aka ka I buworo. 15 Tijie ogwe-aka nke onye nēmebi iwu; Onye ọjọ kwa, I gājuta nmebi-iwu-ya rue mb͕e I gaghi-achọta ya. 16 Jehova bu Eze rue mb͕e nile ebighi-ebi: Mba nile ọzọ esiwo n'ala-Ya lapu n'iyì. 17 I nuwo ihe ndi di ume-ala n'obi nāchọsi ike, Jehova: I nēdozi obi-ha, I nēme ka nti-Gi ge: 18 Ikpe nwa-nb͕ei na onye anāzọpia azọpia ikpe, Ka madu nke sitere n'uwa we ghara ime ka madu ma kwa jijiji ọzọ.

Abù Ọma 11

1 Na Jehova ka m'b͕abàworo: Ùnu si aṅa si nkpuru-obim, Felaganu n'ugwu-unu dika nnunu? 2 N'ihi na, le, ndi nēmebi iwu nāzọ uta-ha ukwu ikwe ya, Ha edoziwo àkù-ha n'elu eriri-uta, Ib͕a ndi obi-ha ziri ezi n'ochichiri. 3 N'ihi na anākwada ide nile; Gini ka onye ezi omume meworo? 4 Jehova nọ n'ulo uku Ya di nsọ, Jehova, n'elu-igwe ka oche-eze-Ya di; Anya-Ya nāhu, mbubere-anya-Ya nānwa, umu madu. 5 Jehova n'anwa onye ezi omume: Ma onye nēmebi iwu na onye nāhu ihe-ike n'anya ka nkpuru-obi-Ya nākpọ asì. 6 Ya me ka ib͕udu zokwasi ndi nēmebi iwu dika miri-ozuzo; Ka ọku na brimstone na ifufe di ọku buru òkè ìko-ha. 7 N'ihi na onye ezi omume ka Jehova bu; ezi omume ka Ọ huru n'anya: Ndi ziri ezi gāhu iru-ya.

Abù Ọma 12

1 Jehova, zọputa; n'ihi na onye-ebere agwusiwo; N'ihi na ndi kwesiri ntukwasi-obi agwupuwo n'etiti umu madu. 2 Ihe-efu ka ha nēkwurita, otù onye na ibe-ya: Eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwu okwu ire-utọ na obi abua ka ha ji ekwu. 3 Ka Jehova bipu eb͕ub͕ere-ọnu nile nke nekwu okwu ire-utọ, Na ire nke nēkwu oké ihe: 4 Ndi siworo, Ayi nēme ire-ayi ka ọ di ike; Eb͕ub͕ere-ọnu-ayi di n'akuku ayi: ònye ka ayi nwere dika onye-nwe-ayi? 5 N'ihi ipunara ndi ewedara n'ala ihe, n'ihi isu-ude nke ndi-ob͕eye, Ub͕u a ka M'gēbili, ka Jehova kwuru; M'gēdo ya na nzọputa nke o nēkusi ume ike inwe. 6 Okwu-ọnu Jehova nile bu okwu-ọnu di ọcha; Ha bu ọla-ọcha anuchaworo n'ite-nnucha nke nērusa n'ala, Nke esichaworo ub͕ò asa. 7 Gi onwe-gi, Jehova, gēdebe ha, I gēchezi ha ka ha pua n'aka ọb͕ọ a rue mb͕e ebighi-ebi. 8 Ndi nēmebi iwu nējeghari buruburu, Mb͕e anēbuli ihe jọb͕uru onwe-ya elu n'ebe umu madu nọ.

Abù Ọma 13

1 Jehova, rùe ole mb͕e ka I gēchezọm ebighi-ebi? Rùe ole mb͕e ka I gēzonarim iru-Gi? 2 Rùe ole mb͕e ka m'gēdo ndum-ọdu nile nime nkpuru-obim, Nēru újú n'obim n'ehihie nile? Rùe ole mb͕e ka agēbuli onye-irom elu ibu onye-isim? 3 Legide anya, zam, Jehova, Chinekem: Nye anyam abua ìhè, ka m'we ghara iraru ura ọnwu; 4 Ka onye-irom we ghara isi, Akariwom ya n'ike; Ka ndi-nkpab͕um we ghara iteghari egwú ọṅù mb͕e anēwezugam n'ọnọdum. 5 Ma ọ bu ebere-Gi ka mu onwem tukwasiworo obi; Ka obim tegharia egwú ọṅù na nzọputa-Gi: 6 Ka m'bùkue Jehova abù, N'ihi na Ọ mesowom nke-ọma.

Abù Ọma 14

1 Onye-nzuzu asiwo n'obi-ya, Ọ dighi Chineke ọ bula di. Ha ebibiwo onwe-ha, ha emewo ka omume-ha buru ihe-árú; Ọ dighi onye nēme ezi ihe. 2 Jehova siri n'elu-igwe lekwasi umu madu anya, Ihu ma ọ di onye nwere uche, Nke nāchọ Chineke. 3 Ha nile ewezugawo onwe-ha; ha ab͕aruwo n'otù dika miri; Ọ dighi onye nēme ezi ihe, ọ dighi ọbuná otù onye. 4 Ndi nile nālu ajọ ihe, hà amaghi ihe? Bú ndi riworo nri site na-iri ndi m, Ma ha akpọkughi Jehova. 5 N'ebe ahu ka ha turu oké egwu; N'hi na Chineke nọ n'ọb͕ọ onye ezi omume. 6 Unu nēme ndum-ọdu nke onye ewedara n'ala ka ọ buru ihe-ihere, N'ihi na Jehova bu ebe-nb͕abà-ya. 7 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na nzọputa Israel esi na Zaion puta! Mb͕e Jehova gēji me ka ndọta-n'agha ndi-Ya lata, Ka Jekob tegharia egwú ọṅù, ka Israel ṅuria ọṅu.

Abù Ọma 15

1 Jehova, ònye gānọ dika ọbìa n'ulo-ikwu-Gi? Ònye gēbi n'ugwu nsọ Gi? 2 Onye nēje ije n'izu-okè, nke nālu kwa ọlu ezi omume, Nke nēkwu kwa ezi-okwu n'obi-ya. 3 O jighi ire-ya kwue okwu-azu, Ọ meghi madu-ibe-ya ihe ọjọ, O bulighi kwa ita-uta megide onye-ab͕ata-obi-ya. 4 Eledawo onye ajuru aju anya n'anya-ya, Ma ndi nātu egwu Jehova ka ọ nā-asọputu. Ọ ṅuwo iyi nke gēmejọ ya onwe-ya, ma ọ dighi-ab͕anwe okwu-ya. 5 Ọ nyeghi ego-ya inara uma, Ọ naraghi kwa ihe-iri-ngo megide onye nēmeghi ihe ọjọ. Onye nēme ihe ndia, agaghi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya rue mb͕e ebighi-ebi.

Abù Ọma 16

1 Debem, Chineke: n'ihi na ab͕abàwom nime Gi. 2 Asiwom Jehova, Onye-nwem ka I bu: Ọdi-nmam adighi-eru Gi aru. 3 Asiwokwam ndi nsọ ndi nọ n'uwa, Na ndi di ebube nke ọ bu nání ihe-ha nātọm utọ: 4 Ihe-nb͕u-ha gāba uba, bú ndi were chi ọzọ n'ọnọdu Jehova: M'gaghi-awusi àjà-ihe-ọṅuṅu-ha nke ọbara, M'gaghi-eburu kwa aha-ha n'elu eb͕ub͕ere-ọnum. 5 Jehova bu òkè nke ihe m'ketara na ìkom: Gi onwe-gi nējide ihe rurum n'ife-nzà. 6 Udọ̀-ọtùtù nile adaworom n'ebe di utọ; N'ezie ihe-nketam dim ezi nma. 7 M'gāgọzi Jehova, Onye duworom ọdu: Ọzọ, akurum abua nādọm aka na nti n'abali nile. 8 Edowom Jehova n'irum mb͕e nile: N'hi na Ọ nọ n'aka-nrim, agaghi-ewzugam n'ọnọdum. 9 N'ihi nka obim aṅuriwo ọṅu, nsọpurum eteghariwo kwa egwú ọṅù: Ọzọ anu-arum gēbi na ntukwasi-obi. 10 N'ihi na I gaghi-arapuru ala-mọ nkpuru-obim; I gaghi-enye onye-ebere-Gi ka ọ hu nbibi. 11 I gēme ka m'mara uzọ ndu: Ojuju-afọ ọṅù di n'iru Gi; E! utọ di iche iche di n'aka-nri-Gi ebighi-ebi.

Abù Ọma 17

1 Jehova, nuru ezi omume, ṅa nti n'iti-nkpum; Ge nti n'ekperem, nke m'nējighi eb͕ub͕ere-ọnu aghughọ kpe. 2 Ka ikpém si n'iru Gi puta; Anya-Gi nāhu izi-ezi. 3 I nwawo obim; I letawom n'abali; I nuchawom, ma I dighi-achọputa ihe; Ezubewom na ọnum agaghi-agabiga ókè. 4 Ma ọlu madu, site n'okwu eb͕ub͕ere-onu-GiKa mu onwem leziworo uzọ nile nke onye nēme ihe-ike anya. 5 Nzọ-ukwum nile ejidewo okporo-uzọ-Gi nile, Ewezugaghi ije-ukwum n'ọnọdu-ha. 6 Mu onwem akpọkuwo Gi, n'ihi na I nāzam, Chineke: Tọrọm nti-Gi n'ala, nuru okwu-ọnum. 7 Me ka ebere-Gi nile guzo iche, Gi Onye ji aka-nri-Gi azọputa ndi nab͕abà nime GiSite n'iru ndi nēbili imegide ha. 8 Debem dika nwa-anya-Gi, Zobem n'okpuru ǹdò nkù-Gi, 9 Site n'iru ndi nēmebi iwu, ndi nāpunaram ihe, Bú ndi-irom nēmegide nkpuru-obim, ndi nāb͕am buruburu. 10 Ha ekpuchiwo obi-ha mara abuba: Ha ejiwo ọnu-ha kwue okwu nime npako. 11 Ub͕u a ha di ayi buruburu na nzọ-ukwu-ayi: Ha nēdo anya-ha ime ka ayi ruru ala. 12 Oyiyi-ya di ka ọdum nke agu idọb͕u anu nāgusi ike, Na dika nwa-ọdum nke nānọdu n'ebe-nzuzo. 13 Bilie, Jehova, Buru ya uzọ, me ka o ruru ala: Me ka nkpuru-obim b͕apu n'aka ndi nēmebi iwu site na mma-agha-Gi; 14 N'aka madu site n'aka-Gi, Jehova, N'aka madu nke uwa, ndi òkè-ha bu na ndu a, Ndi I nēmeju afọ-ha n'ihe-Gi atukọbara atukọba: Afọ nēju ha n'umu, Ha we rapuru umu-ntakiri-ha ihe-ha fọduru. 15 Mu onwem, n'ezi omume ka m'gāhu iru-Gi: Ka afọ jum n'udi gi, mb͕e m'tetara.

Abù Ọma 18

1 Anamahu Gi n'anya nke-uku, Jehova, bú ikem. 2 Jehova bu nkumem di elu, na ebem ewusiri ike, na onye nēme ka mb͕apu; Ọ bu Chinekem, na oké nkumem, anamab͕abà nime Ya; Ọ bu ọtam, na mpi nke nzọputam, na ulo-elum. 3 Onye anēto eto ka Ọ bu, anamakpọku Jehova: Ewe zọputam n'aka ndi-irom. 4 Udọ̀ nile nke ọnwu b͕aram buruburu, Miri-iyi nile nke ihe jọb͕uru onwe-ya nēme kwa ka m'tua egwu. 5 Udọ̀ nile nke ala-mọ dim buruburu: Ọnyà nile nke ọnwu biara n'irum. 6 Anamakpọku Jehova nime nkpà kparam, Ọ bu Chinekem ka m'nētiku: O nēsi n'ulo uku Ya nu olum, Nkpu m'tikuru Ya we ba na nti-Ya abua. 7 Ala we me nkpatu ma kwa jijiji, Ntọ-ala nile nke ugwu nile nāma kwa jijiji, Ewe me ka ha me nkpatu, n'ihi na iwe-Ya di ọku. 8 Anwuru-ọku rigoro n'imi-Ya, Ọku nēsi kwa n'ọnu-Ya ripia: Afunwuru icheku site na ya. 9 O rulata-kwa-ara elu-igwe, rida; Oké ọchichiri di kwa n'okpuru ukwu-Ya abua. 10 O we nọkwasi n'elu cherub dika inyinya, we felie: O we fesie ike n'elu nkù ìfùfè. 11 Ọ nēdo ọchichiri ka ọ buru ebe-nzuzo-Ya, ka ọ buru ulo-ntu-Ya nke di Ya buruburu; Bú ọchichiri miri, igwe-oji b͕ara ọchichiri nke mbara-ígwé. 12 Site n'onwunwu nke nēnwu n'iru Ya igwe-oji-Ya nile nke b͕ara ochichiri gabigara, Akú-miri-ígwé na icheku ọku. 13 Jehova we ma éb͕è-elu-igwe n'elu-igwe, Onye kachasi ihe nile elu nēme kwa ka olu-Ya da; Ákú-miri-ígwé na icheku ọku. 14 O we b͕a àkú-Ya, me ka ha b͕asa; Ọtutu àmùmà kwa, O we chusa ha. 15 Ewe hu ebe nile miri si erù, Anēkpughe kwa ntọ-ala nile nke elu-uwa dum madu bi, Site n'ibasi-nba-ike-Gi, Jehova, Site nume nke iku-ume nke imi-Gi. 16 O si n'elu zìe, kurum, Dọputam n'ọtutu miri. 17 Ọ nānaputam n'aka onye-irom di ike, Na n'aka ndi nākpọm asì, n'ihi na ha nwere ume karim. 18 Ha nābia n'irum n'ubọchi nhuju-anyam: Ma Jehova burum ihe-ndabere. 19 O we me ka m'puta rue ebe sara mbara; Ọ nādọputam, n'ihi na ihem tọrọ Ya utọ. 20 Jehova nēnyeghachim dika ezi omumem si di; Dika idi-ọcha akam abua si di, otú a ka O nēmeghachim ọzọ. 21 N'ihi na edebewom uzọ nile nke Jehova, Emebighikwa m iwu n'ipu n'aka Chinekem. 22 N'ihi na ikpé-Ya nile di n'irum, Ukpuru-Ya kwa, adighm-ewezuga ha n'ebe m'nọ. 23 M'we zue okè n'ebe Ọ nọ, Edebe-kwa-ram onwem pua n'ajo omumem. 24 Jehova we meghachim dika ezi omumem si di, Dika idi-ọcha akam abua n'anya-Ya si di. 25 N'ebe onye-ebere nọ I gēgosi Onwe-gi onye-ebere; N'ebe nwoke zuru okè nọ I gēgosi Onwe-gi onye zuru okè; 26 N'ebe onye di ọcha nọ I gēgosi Onwe-gi onye di ọcha; Ma n'ebe onye b͕agọro ab͕agọ nọ I gēgosi Onwe-gi onye-nb͕á. 27 N'ihi na Gi onwe-gi gāzọputa ndi ewedara n'ala; Ma anya npako, I gēme ka ha di ala. 28 N'ihi na Gi onwe-gi gāmuye oriọnam: Jehova, bú Chinekem, nēme kwa ka ọchichirim nwue enwu. 29 N'ihi na m'nēsite na Gi b͕a ọsọ ichu usu ndi nāpunara madu ihe; Anamesite kwa na Chinekem wubiga mb͕idi. 30 Chineke, uzọ-Ya zuru okè: Okwu-ọnu Jehova bu ihe anuchara anucha; Ọta ka Ọ buru ndi nile nke nāb͕abà nime Ya. 31 N'ihi na ònye bu Chineke, ma-ọbughi Jehova? Ònye bu kwa oké nkume, ma-ọbughi Chineke-ayi? 32 Ọ bu Chineke Nke ji ike kem dika ihe-ọkiké, Ọ nēme kwa ka uzọm zue okè. 33 O nēdozi ukwum ka ha di ka ukwu nne-ele: N'elu ebem di elu ka O nēguzokwam. 34 O nēzi akam abua ibu agha; Ogwe-akam abua nārọgọ kwa uta ọla. 35 I nyewokwam ọta nzọputa-Gi: Aka-nri-Gi nākwagidekwam, Ume-ala-n'obi nke Gi nēmekwam ka m'ba uba. 36 I nēme ka nzọ-ukwum sa mbara n'okpurum, Nkwonkwo-ukwum ab͕uchapughi kwa. 37 Anamachu ndi-irom, we rue ha aru: Adighm-alaghachi kwa rue mb͕e emere ka ha gwusia. 38 Anam akwatu kwa ha, ha apughi kwa ibili ọzọ: Ha nāda n'okpuru ukwum abua. 39 I nēji kwa ike kem dika ihe-ọkiké ibu agha: I nēme ka ndi nēbili imegidem ruru ala n'okpurum. 40 Ndi-irom, I nyewokwam olu-haNdi nākpọm asì, anamekpochapu kwa ha. 41 Ha nēti nkpu ka eyere ha aka, ma ọ dighi onye nāzọputa ha: Ha nētiku Jehova, ma Ọ zaghi ha. 42 Anamasu kwa ha me ka ha di ka ájá n'iru ifufe: Dika apiti èzí ka m'nāwupu ha. 43 I nēme ka m'b͕apu n'ilu-ọ̀gù nile nke ndim; I nēdom onye-isi mba nile ọzọNdi m'nāmaghi gēfèm òfùfè. 44 Mb͕e ha nuru na nti ha nēgem nti: Ndi ala ọzọ nērube isi aghughọ n'okpurum. 45 Ndi ala ọzọ nāta aru, Ma jijiji, si n'ebe-nmechibido-ha puta. 46 Jehova nādi ndu; Onye agọziri agọzi ka oké nkumem bu kwa; Chineke nke nzọputam di kwa elu: 47 Bú Chineke ahu Nke nābọrọm ọ́bọ̀, We duru ndi di iche iche bia n'okpurum. 48 Ọ nēme ka m'baputa n'aka ndi-irom: I nēwelikwam elu kari ndi nēbili imegidem: I nānaputam n'aka madu nēme ihe-ike. 49 N'ihi nka ka m'gēkele Gi, Jehova, n'etiti mba nile, Aha-Gi ka m'gābùku kwa abù ọma. 50 Ọ nēme ka nzọputa eze-Ya di uku; Ọ nēme-kwa-ra onye nke Ya etere manu ebere, Bú Devid, Ọ nēme-kwa-ra nkpuru-ya ebere, rue mb͕e ebighi-ebi.

Abù Ọma 19

1 Elu-igwe nākọ nsọpuru Chineke; Ọ bu kwa ọlu aka-Ya ka mbara elu-igwe nēgosi. 2 Otu ubochi na-agwa ubochi-ibe-ya okwu-onu nuba, Otu abali nekwuputa-kwa-ra abali-ibe-ya ihe-omuma. 3 Okwu-ọnu adighi, ọ dighi kwa okwu di; Anughi olu-ha. 4 N'uwa nile ka eriri-ọtùtù-ha puworo jezue, Na nsọtu elu-uwa dum madu bi ka okwu-ha puwo-kwa-ra jezue. O doworo anyanwu ulo-ikwū nime ha. 5 Anyanwu ahu di kwa ka nwoke nālu nwunye ọhu nke nēsi n'ulo-ndina-ya puta, Obi nātọ ya utọ dika nwoke di ike ib͕aso uzọ-ya. 6 Site n'otù nsọtu elu-igwe ka nputa-ya di, Ib͕a-buruburu-ya diru kwa nsọtu-ya nile: Ọ dighi kwa ihe ezonarioworo okpom-ọku-ya. 7 Iwu Jehova zuru okè, nēweghachi nkpuru-obi: Ihe-àmà Jehova kwesiri ntukwasi-obi, nēme ka onye nēnweghi uche mara ihe. 8 Ukpuru nile Jehova tọrọ ziri ezi, nēme ka obi ṅuria ọṅu: Ihe Jehova nyere n'iwu nēnwu enwu, nēnye anya ìhè. 9 Egwu Jehova di ọcha, nēguzo rue mb͕e ebighi-ebi: Ikpé nile nke Jehova bu ezi-okwu, ha nile ziri ezi n'otù. 10 Ihe anāchọsi ike ka ha bu, kari ọla-edo, e, kari ọtutu ọla-edo anuchara anucha: Ha di kwa utọ kari manu-aṅu bú nke si n'ub͕ub͕ọ-manu-aṅu nātasi. 11 Ọzọ, eji ha dọ orù-Gi aka na nti: N'idebe ha ka ọkpukpu-ọlu riri nne nāputa. 12 Nmehie emehieworo n'amaghi-ama, ònye ga-agbaghara ha? Guam n'onye ikpe ihe-nzuzo nile nāmaghi. 13 B͕ochi kwa orù-Gi na nmehie-nganga; Ekwela ka ha nāchim: mb͕e ahu ka m'gēzu okè, Agāgukwam n'onye ikpe njehie riri nne nāmaghi. 14 Ka okwu nile nke ọnum na ntughari nke obim buru ihe nātọ utọ n'iru Gi, Jehova, bú oké nkumem, na onye-nb͕aputam.

Abù Ọma 20

1 Jehova za gi n'ubọchi nkpà, Aha Chineke nke Jekob me ka i nọ n'elu; 2 Si n'ebe nsọ Ya zìe iye-aka-gi, Si kwa na Zaion kwagide gi; 3 Ya cheta onyinye-gi nile i nyeworo inata iru-ọma, Ya nara kwa àjà-nsure-ọku-gi dika abuba; Selah 4 Ya nye gi dika obi-gi si acho, Mezu kwa ndum-ọdu-gi nile. 5 Ayi gēti nkpu ọṅù na nzọputa-Gi, Ọ bu kwa n'aha Chineke-ayi ka ayi gākwuba ọkọlọtọ-ayi nelu: Jehova mezue aririọ-gi nile. 6 Ub͕u a ka m'maworo na Jehova azọputawo onye nke Ya etere manu; O gēji idi-ike nke nzọputa nke aka-nri-YaZa ya site nelu-igwe-Ya di nsọ. 7 Ufọdu nēhota ub͕o-ala, ndi ọzọ inyinya: Ma ayi onwe-ayi nēhota aha Jehova, bú Chineke-ayi. 8 Ndi ahu eruruwo ala, da kwa ada: Ma ayi onwe-ayi ebiliwo, we guzo onwe-ayi ọtọ. 9 Jehova, zọputa eze: Ya za ayi n'ubọchi ayi kpọkuru Ya.

Abù Ọma 21

1 Jehova, n'ike-Gi ka eze nāṅuri ọṅu; Le kwa otú ọ nēteghari egwú ọṅù nke-uku na nzọputa-Gi! 2 Ọ bu ihe obi-ya nāchọsi ike ka I nyeworo ya, I b͕ochighi kwa arirọ eb͕ub͕ere-ọnu-ya. Selah 3 N'ihi na I ji ngọzi nke ọdi-nma zute ya: I nātukwasi okpu-eze nke ọla-edo anuchara anucha n'isi-ya. 4 Ndu ka Ọ riọrọ n'aka-Gi, I nyewo ya ndu ahu, Bú ubọchi ndu di ogologo rue mb͕e nile ebighi-ebi. 5 Nsọpuru-ya di uku na nzọputa-Gi: Ebube na ima-nma ka I nātukwasi ya. 6 N'ihi na I nēme ya ka ọ buru ngọzi rue mb͕e ebighi-ebi: I nēwere ọṅù me ka ọ ṅuria n'iru Gi. 7 N'ihi na eze nātukwasi Jehova obi, Site kwa n'ebere nke Onye kachasi ihe nile elu agaghi-ewuzuga ya n'ọnọdu-ya. 8 Aka-Gi gāchọputa ndi-iro-Gi nile: Aka-nri-Gi gāchọputa ndi nākpọ Gi asì. 9 I gēme ha ka ha di ka ite-ọku uku di ọku na mb͕e I ji me ka ha hu iru-Gi: Jehova gēloda ha n'iwe-Ya, Ọku gēripia kwa ha. 10 I gēme ka nkpuru-ha si n'uwa la n'iyì, Umu-ha kwa, site n'etiti umu madu. 11 N'ihi na ha setipuru ihe ọjọ megide Gi: Ha chère ihe-nzube nke ha nāpughi ime. 12 N'ihi na I gēme ka ha b͕akuta azu, I gēji udọ̀-uta-I dozi àkú imegide ha n'iru. 13 Jehova, me Onwe-gi ka I di elu n'ike-Gi: Ayi gābù abù, bùku kwa idi-ike-Gi abù ọma.

Abù Ọma 22

1 Chinekem, Chinekem, n'ìhi gini ka I rapurum? N'ìhi gini ka I nọ m n'ebe di nzọputam na okwu nile nke ọb͕ub͕ọ-ujam anya? 2 Chinekem, anamakpọ òkù n'ehihie, ma I dighi-aza; N'abali kwa, ma ọ dighi inọ-jū m'nwere. 3 Ma Gi onwe-gi di nsọ, Gi Onye nānọkwasi n'otuto nile nke Israel dika oche-eze. 4 Na Gi ka nna-ayi-hà tukwasiri obi: Ha tukwasiri obi, I we me ka ha b͕apu. 5 Gi ka ha tikuru, eme-kwa-ra ka ha wepuga onwe-ha: Na Gi ka ha tukwasiri obi, ihere emeghi kwa ha. 6 Ma mu onwem bu idide, ọ bughi kwa madu ka m'bu; Abum ihe-ita-uta nke mmadu, na onye ndim neleda anya. 7 Ndi nile ndi nāhum nāchìm ọchi: Ha na-enu ọnu, fufè isi, si, 8 Turu onwe-gi rue Jehova aru; Ya me ka ọ b͕apu: Ya naputa ya, n'ihi na ihe-ya atọwo Ya utọ. 9 Otú ọ di, Gi onwe-gi bu onye meworo ka m'waputa n'afọ nnem: I nēme ka m'tukwasi obi mb͕e m'nọ nara nnem. 10 Na Gi ka atukwasirim site n'àkpà-nwa: Site n'afọ nnem ka Gi onwe-gi bu Chinekem. 11 Anọlam n'ebe dí anya; n'ihi na nkpab͕u di nso; N'ihi na ọ dighi onye nēyerem aka. 12 Ọtutu oke-ehi dim buruburu: Oke-ehi di ike nke Beshan ab͕awom buruburu. 13 Ha asaghepuwo ọnu-ha n'arum, Dika ọdum nke nādọb͕u anu, nke nāb͕ọ kwa uja. 14 Dika miri ka awusiworom, Ọkpukpum nile ekesawo onwe-ha: Obim aghọwo ihe dika wax; Ọ lọwo miri n'etiti afọm. 15 Ikem akpọwo nku di ka osisi; Irem nārapara kwa n'ab͕am; Ọ bu kwa n'ájá ọnwu ka I nātọb͕ọm. 16 N'ihi na nkita dim buruburu: Nzukọ ndi nēme ihe ọjọ ab͕awom buruburu; Ha nādupú akam abua na ukwum abua. 17 Anamagu ọkpukpum nile ọnu; Ndi ahu nēlegide nēlekwam anya: 18 Ha nēkère onwe-ha uwem, N'elu ihe m'nēyi n'aru ka ha nēfe kwa nzà. 19 Ma Gi onwe-gi, Jehova, anọla n'ebe di anya: Gi ikem, bia ọsọsọ iyerem aka. 20 Naputa nkpuru-obim na mma-agha; Naputa nkpuru-obi m'nwere nání ya náka nkita. 21 Zọputam n'ọnu ọdum; Ọzọ, site na mpi atu ka I zaworom. 22 Agamakọrọ umu-nnem aha-Gi: N'etiti nkpọkọta-Gi ka m'gēto Gi. 23 Ndi nātu egwu Jehova, tonu Ya; Unu nile, bú nkpuru nke Jekob, sọpurunu Ya; Tu-kwa-nu ujọ Ya, unu nkpuru nile nke Israel. 24 N'ihi na O ledaghi nweda-n'ala nke onye ewedara n'ala anya, Ọ kpọghi kwa ya ihe-árú; O zonarighi kwa ya iru-Ya; Ma mb͕e o tikuru Ya, Ọ nuru olu-ya. 25 N'ebe I nọ ka otutom si bia nime nkpọkọta-Gi bara uba: M'gākwughachi nkwam nile n'iru ndi nātu egwu Ya. 26 Ndi di ume-ala n'obi gēri ihe, riju kwa afọ: Ha gēto Jehova, bú ndi nāchọ Ya: Ka obi-unu di ndu rue mb͕e ebighi-ebi. 27 Nsọtu nile nke uwa gēcheta, laghachikute kwa Jehova: Ab͕uru nile nke mba nile gākpọ kwa isi ala n'iru Gi. 28 N'ihi na ọ bu Jehova nwe ala-eze: Ọ nāchi kwa mba nile. 29 Ndi bara uba nile nke uwa gēri ihe, kpọ kwa isi ala: N'iru Ya ka ndi nile ndi nārida n'ájá gēruru ala, Ha na onye nēdebeghi nkpuru-obi-ya ndu. 30 Otù nkpuru gēfè Ya òfùfè; Agākọrọ ọb͕ọ ọzọ akukọ a bayere Onye-nwe-ayi. 31 Ha gābia gosi otù ndi agàmuputa n'iru ezi omume-Ya, Na O mewo ya.

Abù Ọma 23

1 Jehova bu onye nāzùm dika aturu; ó dighi ihe kọrọm. 2 N'ebe-ita-nri nke ahihia ndu ka O nēme ka m'makpu: N'akuku miri nke izu-ike ka Ọ nedum nwayo. 3 Ọ nēweghachi nkpuru-obim: Ọ nēdum n'uzọ nile nke ezi omume n'ihi aha-Ya. 4 Ọzọ, asi na ejem ije na ndagwurugwu onyinyo ọnwu, M'gaghi-atu egwu ihe ọjọ ọ bula; n'ihi na Gi onwe-gi nọyerem: Ndele-Gi na nkpa-n'aka-Gi, ha onwe-ha nākasim obi. 5 I nēdo table n'usoro n'irum n'anya ndi nākpab͕um: I tewo isim manu; ikom bu inwebiga-ihe-ókè. 6 Nání idi-nma na ebere gāb͕asom ubọchi nile nke ndum: M'gēbi kwa n'ulo Jehova rue ogologo ubọchi nile.

Abù Ọma 24

1 Jehova nwe uwa na ùjú-ya; Elu-uwa dum madu bi na ndi bi nime ya. 2 N'ihi na Ya onwe-ya atọwo ntọ-ala-ya n'elu oké osimiri nile, Me kwa ka o guzosie ike n'elu osimiri nile. 3 Ònye gārigo n'ugwu Jehova? Ònye gēguzosi kwa ike n'ebe nsọ Ya? 4 Onye nwere ọbu-aka abua nēmeghi ihe ọjọ, na obi di ọcha; Onye nēbulighi nkpuru-obi-ya nye ihe-efu, Ọ ṅughi kwa iyi aghughọ. 5 Ọ gānata ngọzi n'aka Jehova, Na ezi omume naka Chineke nke nzọputa-ya. 6 Nka bu ọb͕ọ nke ndi nācho Ya, Bú ndi nāchọsi iru-Gi ike, Chineke nke Jekob. Selah 7 Ọnu-uzọ-ama, bulienu isi-unu elu; Ka ebuli kwa unu elu, ọnu-uzọ ebighi-ebi: Eze ebube gābata kwa. 8 Ònye kwa bu Eze ebube a? Ọ bu Jehova, Nke bu dìnkpà na dike, Ọ bu Jehova, Nke bu dike n'agha. 9 Ọnu-uzọ-ama, bulienu isi-unu elu; Buli-kwa-nu ha elu, ọnu-uzọ ebighi-ebi: Eze ebube gābata kwa. 10 Ònye ka Ọ bu, bú Eze ebube a? Ọ bu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Ya onwe-ya bu Eze ebube a. Selah

Abù Ọma 25

1 Gi, Jehova, ka m'nēbuliri nkpuru-obim. 2 Chinekem, na Gi ka m'tukwasiworo obi, Ekwela ka ihere mem; Ekwela ka obi ndi-irom tọ ha utọ n'arum. 3 Ọzọ, ndi nile ndi nēle anya Gi, ihere agaghi-eme ha: Ihere gēme ndi nāghọ aghughọ n'efu. 4 Jehova, me ka m'mara uzọ-gi nile; Zím okporo-uzọ-Gi nile. 5 Mem ka m'zọ ije n'ezi-okwu-Gi, Gi zíkwam ihe; N'ihi na Gi onwe-gi bu Chineke nke nzọputam; Gi ka m'nēle anya Gi ogologo ubọchi nile. 6 Cheta obi-ebere-Gi nile, Jehova, ha na ebere-Gi nile; N'ihi na site na mb͕e ebighi-ebi ka ha diworo. 7 Echetala nmehie nile m'mehiere n'okorọbiam, ha na njehiem nile: Dika ebere-Gi si di Gi onwe-gi chetam, N'ihi idi-nma-Gi, Jehova. 8 Onye di nma na onye ziri ezi ka Jehova bu: Nihi nka ka Ọ nēzi ndi-nmehie ihe n'uzọ. 9 Ọ nēme ka ndi di ume-ala n'obi zọ ije n'ikpé: Ọ nēzi kwa ndi di ume-ala n'obi uzọ-Ya. 10 Okporo-uzọ nile nke Jehova bu ebere na ezi-okwuN'ebe ndi nēchezi ọb͕ub͕a-ndu-Ya na ihe-àmà-Ya nile nọ. 11 N'ihi aha-Gi, Jehova, B͕aghara ajọ omumem, n'ihi na o riri nne. 12 Ònye ka ọ bu, bú nwoke nātu egwu Jehova? O gēzi ya ihe n'uzọ ọ nārọputa. 13 Nkpuru-obi-ya gānọ ọnọdu-abali n'ọdi-nma, Nkpuru-ya gēnweta kwa ala. 14 Ìzù nzuzo Jehova diri ndi nātu egwu Ya; Ya na ọb͕ub͕a-ndu-Ya, ime ka ha mara ihe. 15 Anyam abua di n'ebe Jehova nọ mb͕e nile; N'ihi na Ya onwe-ya gēme ka ukwum abua si n'ub͕u puta. 16 Chem iru, me-kwa-ram amara; N'ihi na onye nání ya nọ na onye ewedara n'ala ka m'bu. 17 Ahuhu nile nke obim sara mbara: Me ka m'si na nkpàm nile puta. 18 Hu nweda-n'alam na ọnọdu ọjọm; Bupu kwa nmehiem nile. 19 Hu ndi-irom, n'ihi na ha di ọtutu; Ha ji ikpọ-asi nke na-eme ihe-ike kpọm asi. 20 Debe nkpuru-obim, naputakwam: Ekwela ka ihere mem, n'ihi na ab͕abàwom nime Gi. 21 Ka izu-okè na izi-ezi chezim, N'ihi na elewom anya Gi. 22 Chineke, b͕aputa IsraelNa nkpà-ya nile.

Abù Ọma 26

1 Kpem ikpe, Jehova, n'ihi na mu onwem ejewo ije n'izu-okèm: Ọ bu kwa na Jehova ka m'tukwasiworo obi, ukwum adighi-ab͕uchapu. 2 Nwà m, Jehova, nwaputakwam; Nucha akurum abua na obim. 3 N'ihi na ebere-Gi di n'iru anyam; Ejeghariwokwam n'ezi-okwu-Gi. 4 Mu na madu efu anọkọghi; Mu na ndi-iru-abua adighi-abàkọ kwa. 5 Akpọwom nkpọkọta ndi nēme ihe ọjọ asì, Mu na ndi nēmebi iwu adighi-anọkọ kwa. 6 Agamakwo ọbu-akam abua na-emeghi-ihe-ọjọ; We b͕a ebe-ichu-àjà-Gi buruburu otú a, Jehova: 7 Ime ka ege nti olu ekele, Na ikọ akukọ bayere oké ọlu-Gi nile. 8 Jehova, ahuwom ebe-obibi nke ulo-gi n'anya, Ya na ọnọdu nke ebe-obibi nke ebube-Gi. 9 Achikọtala nkpuru-obim na ndi-nmehie n'otù, Achikọta-kwa-la ndum na ndi-ọbara n'otù: 10 Ndi nzube ọjọ di n'ka-ha, Aka-nri-ha juputa-kwa-ra n'iri-ngo. 11 Ma mu onwem, n'izu-okèm ka m'gēje ije: B͕aputam, me-kwa-ram amara. 12 Ukwum eguzowo n'ala di lari: Nime nkpọkọta madu nile ka m'gāgọzi Jehova.

Abù Ọma 27

1 Jehova bu ìhèm na nzọputam; ònye ka m'gātu egwu? Jehova bu ebe siri ike nke ndum; ònye ka m'gātu oké egwu? 2 Mb͕e ndi nēme ihe ọjọ biarurum nso iri anu-arum, Bú ndi nākpab͕um na ndi-irom, ha onwe-ha suru ngọngọ, da n'ala. 3 Ọ buru na ọmuma-ulo-ikwū ndi-agha ama ulo-ikwū-ha imegidem, Obim agaghi-atu egwu: Ọ buru na agha ebilie imegidem, Na nka ka mu onwem nātukwasi obi. 4 Otù ihe ka m'riọworo n'aka Jehova, nke ahu ka m'nāchọ; Ọ bu ka m'biri n'ulo Jehova ubọchi nile nke ndum, Ihu idi-utọ Jehova, na ijuta ihe n'ulo uku Ya. 5 N'ihi na Ọ gēdebem na nzuzo n'ulo-ntu-Ya n'ubọchi ihe ọjọ: Ọ gēzobem n'ebe-nzuzo nke ulo-ikwū-Ya; N'oké nkume ka Ọ gēbulim elu. 6 Ma ub͕u a agēbuli isim elu n'elu ndi-irom dim buruburu; M'ga-achukwa àjà nke iti-nkpu n'ulo-ikwū-Ya; M'gābù abù, m'gābùku kwa Jehova abù ọma. 7 Jehova, nuru mb͕e m'were olum kpọ òkù: Me-kwa-ram amara, zakwam. 8 Gi ka obim siworo, Gi kwuru okwu, si, Chọnu irum; Iru-Gi, Jehova, ka m ga-achọ. 9 Ezonarilam iru-Gi; Ejila iwe wezuga orù-Gi: Iye-akam ka I buworo; Ab͕anarilam, arapu-kwa-lam, Chineke nke nzọputam. 10 N'ihi na nnam na nnem arapuwom, Ma Jehova gēkubatam. 11 Jehova, zím uzọ-Gi; Durukwam n'okporo-uzọ di lari, N'ihi ndi nēchem anwu. 12 Enyelam n'aka ọchichọ nkpuru-obi nke ndi nākpab͕um: N'ihi na ndi-àmà okwu-ugha ebiliwo imegidem, ha na ndi nēkupu ihe-ike dika ume. 13 M'gēme aṅa ma asi na ekweghm na m'gēle idi-nma JehovaN'ala ndi di ndu? 14 Nēle anya Jehova: Di ike, ka obi-gi nwe kwa ume; E, nēle anya Jehova.

Abù Ọma 28

1 Gi, Jehova, ka m'nākpọku; Oké nkumem, echila nti n'ebe m'nọ: Ka I we ghara ib͕am nkiti, M'we yie ndi nārida n'olùlù. 2 Nuru olu aririọ-amaram nile mb͕e m'tikuru Gi, Mb͕e m'chiliri akam abua n'ebe ime-ime-ulo nke ebe nsọ Gi di. 3 Adọkpurulam tiyere ndi nēmebi iwu, Tiye-kwa-ra ndi nālu ajọ ihe; Ndi nāgwa madu-ibe-ha okwu udo, Ma ihe ọjọ di n'obi-ha. 4 Nye ha dika ọlu-ha si di, na dika ijọ-njọ nke nmeso nile ha si di: Nye ha dika aka-ha si eme; Nyeghachi ha ihe ha mere. 5 N'ihi na ha adighi-aghọta ọlu nile nke Jehova, Na n'ihi na ha adighi-aghọta ihe aka-Ya abua meworo, Ọ gākwada ha, Ọ gaghi-ewulita ha elu dika ulo. 6 Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, N'ihi na Ọ nuwo olu aririọ-amaram nile. 7 Jehova bu ikem na ọtam; Ya ka obim tukwasiworo obi, eyewo-kwa-ram aka: Obim we nāwuli elu n'ọṅù; M'gēsite kwa n'abùm kele Ya. 8 Jehova buru ya ike, Ebe siri ike nke nzọputa nke onye nke Ya etere manu ka Ọ bu. 9 Zọputa ndi-Gi, gozi kwa ihe-nketa-Gi: Nāzù kwa ha dika aturu, nēku kwa ha n'aka-Gi rue mb͕e ebighi-ebi.

Abù Ọma 29

1 Nyenu Jehova, unu umu Chineke, Nyenu Jehova nsọpuru na ike. 2 Nyenu Jehova nsọpuru aha-Ya; Kpọnu isi ala nye Jehova n'ima-nma nke idi-nsọ. 3 Olu Jehova di n'elu miri: Chineke nke ebube nāma éb͕è-elu-igwe, Jehova nọ n'elu ọtutu miri. 4 Olu Jehova nāda n'ike; Olu Jehova nāda n'ima-nma. 5 Olu Jehova nētiwa osisi cedar; Jehova we tiwasia osisi cedar nke Lebanon. 6 Ọ nēme ka ha nāwuli elu dika nwa-ehi; Bú Lebanon na Siron, dika nwa-atu. 7 Olu Jehova nāwaputa ire ọku. 8 Olu Jehova nēme ka ọzara me nkpatu; Jehova nēme ka ọzara Kedesh me nkpatu. 9 Olu Jehova nēme ka ime nēme nne-ele, Ọ nāb͕uchapu kwa akwukwọ osisi oké ọhia: Ọzọ n'ulo uku Ya ihe hile nāsi, Ebube. 10 Jehova nọduru n'oche-eze n'Iju-miri ahu; Jehova we nọdu dika eze rue mb͕e ebighi-ebi. 11 Jehova gēnye ndi-Ya ike; Jehova gēji udo gọzie ndi-Ya.

Abù Ọma 30

1 M'gēbuli Gi elu, Jehova; n'ihi na I dọgowom n'elu, I meghi kwa ka ndi-irom ṅuriam. 2 Jehova, bú Chinekem, Etikurum, I, I we me ka m'diri ndu. 3 Jehova, I mewo ka nkpuru-obim si n'ala-mọ rigoputa: I mewo ka m'si n'etiti ndi nārida n'olùlù di ndu. 4 Bùkuenu Jehova abù ọma, unu ndi-ebere-Ya, Kele-kwa-nu ihe-ncheta-Ya di nsọ. 5 N'ihi na nání otù ntabi-anya nāgabiga n'iwe-Ya; Ogologo ndu nile nāgabiga na mb͕e ihe-ayi nātọ Yautọ: N'anyasi ikwa-ákwá gābia inọ ọnọdu-abali, Ma n'ututu iti-nkpu-ọṅù gādi. 6 Ma mu onwem, asirim n'udom, Agaghi-ewezugam n'ọnọdum rue mb͕e egighi-ebi. 7 Jehova, I ji ka ihem si atọ Gi utọ me ka ike guzoro ukwu m: I zobere iru-Gi; aghọrọm onye nāma jijiji. 8 Gi, Jehova, ka m'nākpọku; Ọ bu kwa Onye-nwe-ayi ka m'nāriọ aririọ-amara: 9 Ùrù gini di n'ọbaram, mb͕e m'na-arida n'olùlù? Ájá, ọ̀ gēkele Gi? ò gēgosi ezi-okwu-Gi? 10 Nuru, Jehova, me-kwa-ram amara: Jehova, buru onye nēyerem aka. 11 I b͕anweworom iti-aka-n'obim ka ọ ghọ ite-egwú; I tọpuwo ákwà-nkpem, were ọṅù kem dika ihe-ọkiké: 12 Ka nsọpurum we bùkue Gi abù ọma, ghara idere du. Jehova, bú Chinekem rue mb͕e ebighi-ebi ka m'gēkele Gi.

Abù Ọma 31

1 Nime Gi, Jehova, ka m'b͕abàworo; ekwela ka ihere mem rue mb͕e ebighi-ebi: N'ezi omume-gi me ka m'b͕apu. 2 Tọrọm nti-Gi n'ala; naputam ngwa ngwa: Ghọrọm oké nkume nke ebe siri ike, bú ulo nke ebe ewusiri ike nke-uku izọputam. 3 N'ihi na nkumem di elu na ebem ewusiri ike ka I bu; Ọzọ, n'ihi aha-Gi I gēdum, dukwam nwayo. 4 I gēme ka m'si n'ub͕u nke ha zoberem puta; N'ihi na Gi onwe-gi bu ebem siri ike. 5 N'aka-Gi ka m'nēnye mọm idebe: I b͕aputawom, Jehova, Chineke nke ezi-okwu. 6 Akpọwom ha asì, bú ndi nāriba ihe-efu nile nke nābughi ihe ama: Ma mu onwem atukwasiwo obi na Jehova. 7 Ka m'tegharia egwú ọṅu, ṅuri kwa ọṅu, n'ebere-Gi: N'ihi na I huwo nweda-n'alam; I mawo nkpuru-obim n'ahuhu di iche iche: 8 I mechibidoghkwam nye n'aka onye-iro; I mewo ka ukwum abua guzo n'ebe sara mbara. 9 Merem amara, Jehova, n'ihi na anọm na nkpab͕u: Anyam emebiwo nime nkpasu-iwem, ya na nkpuru-obim, na afọm, dika uwe nla mebiri. 10 N'ihi na ndum agwusiwo n'iru-újú, na arọm nile n'ize-ume: Ikem asuwo ngọngọ site n'ajọ omumem, ọkpukpum nile emebiwo kwa, dika uwe nla mebiri. 11 N'ihi ndi-nkpab͕um nile aghọwom ihe-ita-uta nke-uku, Ọbuná n'ebe ndi-ab͕ata-obim nọ aghọwo-kwa-ram ndi m'mara oké egwu: Ndi nāhum n'èzí ab͕anariwom. 12 Echezọwo mu onwem dika onye nwuru anwu puru n'obi madu: Aghọwom ihe nāla n'iyì. 13 N'ihi na anuwom akukọ ọjọ nke ọtutu madu, Ujọ dim buruburu: Mb͕e ha nāb͕a ìzù n'otù imegidem, Ha zubere iwepu ndum. 14 Ma mu onwem, ọ bu Gi ka m'tukwasiworo obi, Jehova: Asiwom, Chinekem ka I bu. 15 N'aka-Gi ka mb͕em nile di: Naputam n'aka ndi-irom, na n'aka ndi nēsob͕um. 16 Me ka iru-Gi nye orù-gi ìhè: Zọputam n'ihi ebere-Gi. 17 Jehova, ekwela ka ihere mem; n'ihi na akpọkuwom I: Ka ihere me ndi nēmebi iwu, ka ha debe ọnu-ha du n'ala-mọ. 18 Ka eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha da ob͕i; Nke nēkwu oké okwu megide onye ezi omume, Nime npako na nleda-anya. 19 Le ka ezi ihe-Gi si ba uba, nke I tukọbaworo nye ndi nātu egwu Gi, Nke I luworo nye ndi nāb͕abà nime Gi n'iru umu madu! 20 I nēzobe ha n'ebe-nzuzo nke iru-Gi ka ha pua n'aka nkekọta nile nke madu: I nēdebe ha na nzuzo n'ulo-ntu ka ha pua n'ise-okwu nke ire di iche iche. 21 Onye agọziri agọzi ka Jehova bu: N'ihi na O mewo ka ebere-Ya di ebube n'ebe m'nọ n'obodo ewusiri ike. 22 Ma mu onwem, asirim na nkujam, Ebipuwom n'anya-Gi: Otú ọ di, I nuru olu aririọ-amaram nile mb͕e m'tikuru Gi. 23 Hunu Jehova n'anya, ndi-ebere-Ya nile: Ọ bu ndi kwesiri ntukwasi-obi ka Jehova nēchezi, Ọ nākwughachibiga kwa onye nēme omume npako ókè. 24 Dinu ike, ka obi-unu nwe kwa ume, Unu nile ndi nēchere Jehova.

Abù Ọma 32

1 Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú onye ebupuworo njehie-ya, onye ekpuchiworo nmehie-ya. 2 Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú madu nke Jehova nādighi-aguru ya ajọ omume, Bú onye ọ dighi aghughọ ọ bula di na mọ-ya. 3 Mb͕e m'b͕ara nkiti, ọkpukpum nile kara nkáSite n'ọb͕ub͕ọ-ujam ogologo ubọchi nile. 4 N'ihi na ehihie na abali aka-Gi di arọ̀ n'arum: Umem b͕anwere n'ihe-ikpọ-nku nke uguru. Selah 5 Anamemeri ka I mara nmehiem, ekpuchighkwam ajọ omumem: M'siri, M'gēkwuputara Jehova njehiem nile; Gi onwe-Gi bupu-kwa-ra ajọ omume nke nmehiem. Selah 6 N'ihi nka ka onye-ebere ọ bula kpere Gi na mb͕e agēji chọta Gi: N'ezie n'iju-miri nke ọtutu miri ha agaghi-eru ya aru. 7 Gi onwe-gi burum ebe-nzuzo; I gēchezim ka m'pua n'ahuhu; Iti-nkpu nke mb͕e anēme ka ab͕apu, ndia ka I gēme ka ha dim buruburu. Selah 8 M'gēme ka i nwe uche, M'gēzi kwa gi ihe n'uzọ nke i gēje ije nime ya: M'gādu gi ọdu, anyam gādikwasi kwa gi n'aru. 9 Unu adila ka inyinya, ma-ọbu dika inyinya mule, nke ọ dighi nghọta ha nwere: Agēji kwa bit na bridle, dika ihe-ekike, ijide ha, Ma emeghi otú a ha agaghi-abiaru nso gi. 10 Ọtutu ihe-nb͕u gādiri onye nēmebi iwu: Ma onye nātukwasi obi na Jehova, ebere gādi ya buruburu. 11 Ṅurianu ọṅu na Jehova, teghari-kwa-nu egwú ọṅù, unu ndi ezi omume: Ti-kwa-nu nkpu ọṅù, unu nile ndi ziri ezi n'obi.

Abù Ọma 33

1 Tienu nkpu ọṅù nime Jehova, unu ndi ezi omume: N'ebe ndi ziri ezi nọ otuto mara nma. 2 Werenu ubọ-akwara kele Jehova: Werenu une nke akwara iri bùkue Ya abù ọma. 3 Bùkueune Ya abù ọhu; Werenu iti-nkpu me ka ọkpukpọ-ubọ di nma. 4 N'ihi na okwu Jehova ziri ezi; Anālu kwa ọlu-Ya nile n'ikwesi-ntukwasi-obi. 5 Ọ nāhu ezi omume na ezi ikpé n'anya: Uwa juputara n'ebere jehova. 6 Okwu Jehova ka ejiri me elu-igwe; Eji-kwa-ra iku-ume nke ọnu-Ya me usu-ha nile. 7 Ọ nāchikọta miri oké osimiri dika obo-ihe: Ọ nētiye ob͕u-miri n'ulo-àkù di iche iche. 8 Ka uwa nile tua egwu Jehova: Ka ndi nile ndi bi n'elu-uwa dum madu bi tua ujọ Ya. 9 N'ihi na Ya onwe-ya kwuru okwu, o we di; Ya onwe-ya nyere iwu, o we guzo. 10 Jehova emebiwo ndum-ọdu mba nile: Ọ siwo èchìchè nile nke ndi di iche iche, É-è. 11 Ndum-ọdu Jehova nēguzo rue mb͕e ebighi-ebi, Èchìchè nile nke obi-Ya rue ọb͕ọ nile. 12 Mba ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú mba ahu nke Jehova bu Chineke-ya; Bú ndi ahu Ọ rọputara iburu Ya ihe-nketa. 13 Jehova siri n'elu-igwe legide anya; Ọ huwo umu madu nile; 14 Ọ siwo n'ọnọdu ebe-obibi-YaLekwasi ndi nile bi n'uwa anya; 15 Bú Onye ahu Nke nākpu obi ha nile n'otù, Nke nāghọta kwa ọlu nile nke ha nile. 16 Ọ dighi eze anēji uba nke usu-ndi-agha-ya zọputa: Adighi-eji kwa ike riri nne naputa dike. 17 Nání ihe-nrafu ka inyinya bu iji zọputa madu: Ọ dighi-eji kwa ike-ya riri nne me ka madu wepuga onwe-ya. 18 Le, anya Jehova di n'aru ndi nātu egwu Ya, Bú n'aru ndi nēchere ebere-Ya; 19 Inaputa nkpuru-obi-ha n'ọnwu, Na idebe ha ndu n'oké unwu. 20 Nkpuru-obi-ayi echerewo Jehova: Iye-aka-ayi na ọta-ayi ka Ọ bu. 21 N'ihi na ọ bu nime Ya ka obi-ayi nāṅuri ọṅu, N'ihi na ọ bu aha nsọ Ya ka ayi tukwasiworo obi. 22 Jehova, ka ebere-Gi dikwasi ayi, Dika ayi chereworo Gi.

Abù Ọma 34

1 M'gāgọzi Jehova na mb͕e nile: Mb͕e nile ka otuto-Ya gādi n'ọnum. 2 Jehova ka nkpuru-obim gēji nya isi: Ndi di ume-ala n'obi gānu ya, we ṅuria ọṅu. 3 Sonum me ka Jehova di uku, Ka ayi buli kwa aha-Ya elu n'otù. 4 Achọrọm Jehova, Ọ za-kwa-ram, We naputam n'ujọm nile. 5 Ha legidere Ya anya, we nwue enwu: Ka ihere ghara ime kwa ha n'iru. 6 Onye a ewedara n'ala kpọrọ òkù, Jehova we nuru ya, We si na nkpab͕u-ya nile zọputa ya. 7 Mọ-ozi nke Jehova nāma ulo-ikwū-ya buruburu ndi nātu egwu Ya, Ọ we dọputa ha. 8 Detunu ire, hu na Jehova di nma: Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú nwoke nke nāb͕abà nime Ya. 9 Tuanu egwu Jehova, unu ndi nsọ Ya: N'ihi na ọ dighi ihe nākọ ndi nātu egwu Ya. 10 Nkpà akpawo umu-ọdum, agu aguwo kwa ha: Ma ndi nāchọ Jehova, ọ dighi ezi ihe ọ bula gākọ ha. 11 Bianu, umum, gem nti: Egwu Jehova ka m'gēzi unu. 12 Ònye bu nwoke ahu nke ndu nātọ ya utọ, Nke nāhu ubọchi nile nke ndu n'anya, ka o we hu ọdi-nma? 13 Chezi ire-gi ka ọ ghara ikwu ihe ọjọ, chezi kwa eb͕ub͕ere-ọnu-gi ka ha ghara ikwu okwu aghughọ. 14 Si n'ihe ọjọ wezuga onwe-gi, me ezi ihe; Nāchọsi udo ike, b͕aso kwa ya. 15 Anya abua nke Jehova di n'aru ndi ezi omume, Nti-Ya abua ghe-kwa-ra oghe na nkpu ha nētiku Ya. 16 Iru Jehova nēmegide ndi nēme ihe ọjọ, Ibipu ncheta-ha n'uwa. 17 Ndi ezi omume tiri nkpu, Jehova we nuru, We si na nkpab͕u-ha nile naputa ha. 18 Jehova nọ nso ndi obi-ha tiwara etiwa, Ọ nāzọputa kwa ndi azọpiaworo nime mọ-ha. 19 Ha di ọtutu, bú ihe ọjọ nke nādakwasi onye ezi omume: Ma n'aka ha nile ka Jehova nānaputa ya. 20 Ọ nēdebe ọkpukpu-ya nile: Ọ dighi otù nime ha nyajiri anyaji. 21 Ihe ọjọ gēme ka onye nēmebi iwu nwua: Ọzọ, ndi nākpọ onye ezi omume asì, agāma ha ikpe. 22 Jehova nāb͕aputa nkpuru-obi ndi-orù-Ya: Agaghi-ama kwa ha ikpe, bú ndi nile nāb͕abà nime Ya.

Abù Ọma 35

1 Jehova, luso ha ọ̀gù, bú ndi nālusom ọ̀gù: Buso ha agha, bú ndi nēbusom agha. 2 Jide ọta na ọta uku, Bilie iyerem aka. 3 Seputa kwa ube na anyu-ike-agha izute ndi nāchum: Si nkpuru-obim, Nzọputa-gi ka M'bu. 4 Ka ihere me ha, ka etiye kwa ha n'ọnọdu-ihere, bú ndi nāchọsi nkpuru-obim ike: Ka ha b͕aghachi azu nwe iru-ihere, bú ndi nēchè ihe ọjọ ha gēmem. 5 Ka ha di ka ib͕ob͕o-ọka n'iru ifufe, Ka mọ-ozi nke Jehova buru kwa onye nēnupu ha. 6 Ka uzọ-ha b͕a ọchichiri, ka ọ buru kwa ebe nālo nālọ, Ka mọ-ozi nke Jehova buru kwa onye nāchu ha. 7 N'ihi na ọ bu mb͕e m'nēmeghi ihe ka ha zoberem olùlù nke ub͕u-ha, Ọ bu mb͕e m'nēmeghi ihe ka ha gwuru olùlù nye nkpuru-obim. 8 Ka ntikpọ biakwasi ya mb͕e ọ nāmaghi; Ọzọ, ka ub͕u-ya nke o zobeworo jide ya onwe-ya: Nime ntikpọ ahu, ya dabà nime ya. 9 Nkpuru-obim gēteghari kwa egwú ọṅù na Jehova: Obi gātọ ya utọ na nzọputa-Ya. 10 Ọkpukpum nile gāsi, Jehova, ònye di ka Gi? Gi Onye nānaputa onye ewedara n'ala n'aka onye di ike kari ya, I nānaputa onye ewedara n'ala na ob͕eye n'aka onye nānapu ya ihe n'ike. 11 Ndi-àmà nke ihe-ike nēbili; Ihe nke m'nāmaghi ka ha nājum. 12 Ha nākwughachim ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe, Nkpuru-obim di ka onye b͕a aka nwa. 13 Ma mu onwem, mb͕e ha nāri ọria, uwem bu ákwà-nkpe: Ewedaram nkpuru-obim n'ala site n'obubu-ọnu; Ekperem nālaghachikute kwa obim. 14 Dika agasi na ọ burum eyì, dika agāsi na ọ burum nwa-nne, otú a ka m'jeghariri: Dika onye nēru újú nne-ya, otú a ka m'rudara n'ala nēyi uwe-nkpe. 15 Ma mb͕e m'nāru ukwu ha ṅuriri ọṅu, chikọta onwe-ha: Ha chikọtara onwe-ha imegidem, nētib͕um mb͕e m'nāmaghi; Ha dọkaram, ha eguzoghi kwa du: 16 Dika ndi emeruru emeru n'etiti ndi nāchì ọchì n'ihi ob͕e-achicha, Otú a ka ha takwasirim ikekere-ezé. 17 Onye-nwe-ayi, #mb͕e ole ka I ganēle anya? Si na ntikpọ nile ha weghachi nkpuru-obim, Si n'aka umu-ọdum weghachi nkpuru-obi m'nwere nání ya. 18 M'gēkele Gi n'etiti nkpọkọta bara uba: N'etiti otù ndi nwere ume ka m'gēto Gi. 19 Ekwela ka ndi-irom, bú ndi-okwu-ugha, ṅuam ọǹu: Ekwela ka ndi nākpọm asì mb͕e m'nēmeghi ihe b͕ue iku-anya. 20 N'ihi na ọ bughi okwu udo ka ha nēkwu: Ma ha nēchèputa okwu di iche iche nke aghughọ nile imegide ndi nọ jū n'ala. 21 Ha we me ka ọnu-ha sa mbara imegidem; Ha siri, Ehe, ehe, anya-ayi ahuwo ya. 22 I huwo ya, Jehova; ab͕ala nkiti: Onye-nwe-ayi, anọlam n'ebe di anya. 23 Kpọte Onwe-gi, kpetara ikpe m, Chinekem na Onye-nwem, tetara okwu-ikpem. 24 Kpem ikpe dika ezi omume-Gi si di, Jehova, bú Chinekem; Ekwe-kwa-la ka ha ǹuam ọǹu. 25 Ekwela ka ha si n'obi-ha, Ehe, nka bu ọchichọ nkpuru-obi-ayi: Ekwela ka ha si, Ayi elodawo ya. 26 Ka ihere me ha, ka ha nile nwe kwa iru-ihere n'otù, bú ndi na-aṅuri ọǹu n'ihe ọjọ nādakwasim: Ka ha yiri ihere na ọnọdu-ihere dika uwe, bú ndi nēme onwe-ha ka ha di uku imegidem. 27 Ka ha tie nkpu ọṅù, ṅuri kwa ọṅu, bú ndi ezi omumem nātọ utọ: Ka ha nāsi kwa mb͕e nile, Jehova di uku, Onye udo orù-Ya nātọ Ya utọ. 28 Irem ganēkwu okwu, dika onye nātughari uche, bayere ezi omume-Gi, Baye-kwa-ra otuto-Gi ogologo ubọchi nile.

Abù Ọma 36

1 Ihe nke nāputa n'ọnu njehie nke onye nēmebi iwu nāsi n'etiti obimỌ dighi oké egwu Chineke di n'anya-ya abua. 2 N'ihi na ọ nāgwa onwe-ya okwu ire-utọ n'anya onwe-ya, Bayere ichọputa ajọ omume-ya na ikpọ ya asì. 3 Okwu nile nke ọnu-ya bu ajọ ihe na aghughọ: Ọ rapuwo inwe uche na ime nma. 4 Ajọ ihe ka ọ nēchè n'elu ihe-ndina-ya; Ọ nēguzo onwe-ya n'uzọ nke nādighi nma; Ọ dighi-aju ihe ọjọ. 5 Jehova, n'elu-igwe ka ebere-Gi di; Ikwesi-ntukwasi-obi-Gi nēru mbara-ígwé. 6 Ezi omume-Gi di ka ugwu Chineke; Ikpé-Gi nile bu ob͕u-miri riri nne: Ọ bu madu na anumanu ka I nāzọputa, Jehova. 7 Le ka ebere-Gi si di oké ọnu-ahia, Chineke! Umu madu nāb͕abá kwa n'okpuru ǹdò nkù-Gi abua. 8 Afọ nējubiga ha ókè site n'abuba nke ulo-Gi; Ọ bu kwa miri-iyi nke ihe-utọ-Gi nile ka I nēme ka ha ǹua. 9 N'ihi na n'ebe I nọ ka isi-iyi ndu di: N'ìhè-Gi ka ayi nāhu ìhè. 10 Me ka ebere-Gi digidere ndi mara Gi; Me kwa ka ezi omume-Gi digidere ndi ziri ezi n'obi. 11 Ekwela ka ukwu npako biakwasim, Ekwe-kwa-la ka aka nke ndi nēmebi iwu me ka m'wagharia. 12 N'ebe ahu ka ndi nālu ajọ ihe daworo: Enudawo ha, ha apughi kwa ibili ọzọ.

Abù Ọma 37

1 Emela ka iwe-gi di ọku n'ihi ndi nēme ihe ọjọ, Ekwosola ndi nēme ajọ omume ekworo. 2 N'ihi na dika ahihia ka agēbipu ha ngwa ngwa, Dika akwukwọ ahihia ndu ka ha gākpọnwu. 3 Tukwasi Jehova obi, me kwa ezi ihe; Biri n'ala, nāzù kwa onwe-gi n'ikwesi-ntukwasi-obi. 4 Ka ihe Jehova tọ kwa gi utọ; Ọ gēnye kwa gi ihe nile obi-gi nāriọ. 5 Kpọre uzọ-gi ru Jehova aru; Tukwasi kwa Ya obi, Ya onwe-ya gēme kwa ya. 6 Ọ gēme kwa ka ezi omume-gi puta dika ìhè, Ikpé-gi kwa dika etiti-ehihie. 7 Nọ dū n'iru Jehova, were kwa ntachi-obi nēchere Ya: Emela ka iwe-gi di ọku n'ihi onye ọ nāgara nke-ọme n'uzọ ya, N'ihi madu nke na-eme ajọ ihe-nzube di iche iche. 8 Ra aka iwe iwe, rapu kwa ọnuma: Emela ka iwe-gi di ọku, o nēdubà nání n'ime ihe ọjọ. 9 N'ihi na agēbipu ndi nēme ihe ọjọ: Ma ndi nēle anya Jehova, ndi ahu gēnweta ala. 10 Ma ọ fọduru nwa mb͕e, onye nēmebi iwu agaghi-adi kwa: I gēlekwasi kwa ọnọdu-ya anya, ma ọ gaghi-anọ. 11 Ma ndi di ume-ala n'obi gēnweta ala; Iba-uba nke udo gātọ kwa ha utọ. 12 Onye nēmebi iwu nēzube ajọ ihe imegide onye ezi omume, Ọ nātakwasi kwa ya ikekere-ezé. 13 Onye-nwe-ayi nāchì ya ọchì: N'ihi na Ọ huwo na ubọchi-ya nābia 14 Ndi nēmebi iwu amiputawo mma-agha, zọ kwa uta-ha ukwu ikwe ya; Ime ka onye ewedara n'ala na ob͕eye da, Ib͕u ndi ziri ezi n'uzọ-ha: 15 Mma-agha-ha gābà n'obi onwe-ha, Agāb͕aji kwa uta-ha. 16 Ihe ntà onye ezi omume nwere di nmaKari ihe bara uba nke ọtutu ndi nēmebi iwu. 17 N'ihi na agāb͕aji ogwe-aka nke ndi nēmebi iwu: Ma Jehova nākwagide ndi ezi omume. 18 Jehova mara ubọchi nile nke ndi zuru okè: Ihe-nketa-ha gādiru kwa mb͕e ebighi-ebi. 19 Ihere agaghi-eme ha na mb͕e ihe ọjọ: Afọ gēju kwa ha n'ubọchi oké unwu. 20 N'ihi na ndi nēmebi iwu gāla n'iyì, Ndi-iro Jehova gādi ka ihe di oké ọnu-ahia nke umu-aturu: Ha gēdè; n'anwuru-ọku ka ha gēdè. 21 Onye nēmebi iwu nēbiri ihe, ma ọ dighi-akwughachi: Ma onye ezi omume nēme amara, nēnye kwa enye. 22 N'ihi na ndi Ọ nāgọzi gēnweta ala; Ma agēbipu ndi Ọ nākọcha. 23 Site n'aka Jehova ka emeworo ka nzọ-ukwu nile nke madu guzosie ike; Uzọ-ya nātọ kwa Ya utọ. 24 Mb͕e ọ gada, agaghi-atudasi ya: N'ihi na Jehova nākwagide aka-ya. 25 Nwata ka m'buworo, aghọwokwam okenye; Ma ahughm onye ezi omume ka arapuru ya, Ahughkwam nkpuru-ya ka ha nāriọ nri. 26 Ogologo ubọchi nile ka ọ nēme amara, nēbinye kwa ihe; Nkpuru-ya bu kwa ndi agọziri agọzi. 27 Si n'ihe ọjọ wezuga onwe-gi, me ezi ihe; Biri kwa rue mb͕e ebighi-ebi. 28 N'ihi na Jehova nāhu ezi ikpé n'anya, Ọ dighi-arapu kwa ndi-ebere-Ya; Rue mb͕e ebighi-ebi ka anēdebe ha: Ma agēbipu nkpuru ndi nēmebi iwu. 29 Ndi ezi omume gēnweta ala, Biri kwa n'elu ya rue mb͕e ebighi-ebi. 30 Ọnu onye ezi omume nēkwu okwu amam-ihe, dika onye nātughari uche, Ire-ya nēkwu kwa okwu ezi ikpé. 31 Iwu Chineke-ya di n'obi-ya; Nzọ-ukwu-ya nile agaghi-ab͕uchapu kwa. 32 Onye nēmebi iwu nēche onye ezi omume nche, Nāchọ kwa ime ka ọ nwua. 33 Jehova agaghi-arapu ya n'aka-ya, Ọ gaghi-ama kwa ya ikpe mb͕e anēkpe ya ikpe. 34 Nēle anya Jehova, nēdebe kwa uzọ-Ya, Ọ gēbuli kwa gi inweta ala: Mb͕e anēbipu ndi nēmebi iwu, i gāhu. 35 Ahuwom onye nēmebi iwu ka ọ nēme madu ka ha ma jijiji, Ahuwokwam ya ka ọ nāwasa onwe-ya dika osisi di ndu n'ala mara ya. 36 O we gabiga, ma, le, ọ nọgh: M'we chọ ya, ma achọtaghi ya. 37 Riba onye zuru okè ama, le kwa onye ziri ezi: N'ihi na ọdi-n'iru diri onye-udo. 38 Ma ndi-njehie, anēkpochapu ha n'otù: Agēbipu ọdi-n'iru nke ndi nēmebi iwu. 39 Ma nzọputa ndi ezi omume nēsi n'aka Jehova bia: Ọ bu ebe-ha siri ike na mb͕e nkpà. 40 Jehova nēye-kwa-ra ha aka, nēme ka ha b͕apu: Ọ nēme ka ha si n'aka ndi nēmebi iwu b͕apu, Ọ nāzọputa kwa ha, N'ihi na ha ab͕abàwo nime Ya.

Abù Ọma 38

1 Jehova, abalaram nba n'iwe-Gi: Adọ-kwa-lam aka na nti n'ọnuma-Gi. 2 N'ihi na àkú-Gi nile efedakwasiwom, Aka-Gi adakwasiwokwam. 3 Ọ dighi izu-okè ọ bula di n'anu-arum n'ihi iwe-Gi; Ọ dighi kwa udo ọ bula di n'ọkpukpum nile n'ihi nmehiem. 4 N'ihi na ajọ omumem nile agabigawo n'elu isim: Dika ibu arọ́ ha dikaram arọ́. 5 Ufiri-utalim nile nēsì ísì, nāb͕u kwa miri, N'ihi uchem b͕agọro ab͕agọ. 6 Ab͕agọrọm ab͕agọ ruda kwa nke-uku; Ogologo ubọchi nile ka m'jeghariworo nēyi uwe-nkpe. 7 N'ihi na úkwùm juputara na nruru-ọku; Ọ dighi kwa izu-okè ọ bula di n'anu-arum. 8 Arum esinwuwo, egwepiawokwam nke-uku: Ab͕ọwom uja n'ihi isu-ude nke obim. 9 Onye-nwe-ayi, n'iru Gi ka ichọsi-ikem nile di; Ize-umem ezonarighi kwa Gi. 10 Obim nēti ike ike, ikem esiwo nimem la: Ìhè nke anyam abua kwa, ọbuná ìhè nke anyam ahu adighi n'arum. 11 Ndi nāhum n'anya na ndi-eyìm nēguzo iche na ncherita-iru ihe-otitim; Ndi-ab͕ata-obim nēguzo kwa n'ebe di anya. 12 Ndi nāchọsi nkpuru-obim ike nēsi-kwa-ram ọnyà; Ndi nāchọ imem ihe ọjọ ekwuwo kwa ihe-ila-n'iyì di iche iche, Ọ bu kwa ihe-aghughọ nile ka ha nātughari n'uche ogologo ubọchi nile. 13 Ma mu onwem, dika onye nti chiri, adighm-anu ihe; Adikwam ka onye-ob͕i nke nādighi-asaghe ọnu-ya. 14 E, adim ka madu nke nādighi-anu iheOnye iba-nba ọ bula nādighi n'ọnu-ya. 15 N'ihi na Gi, Jehova, ka m'chereworo: Gi onwe-gi gāza, Onye-nwe-ayi, Chinekem. 16 N'ihi na asirim, Ka ha ghara iṅuri ọṅu n'arum: Mb͕e anēwezuga ukwum n'ọnọdu-ya, ha mere onwe-ha ka ha di uku imegidem. 17 N'ihi na mu owem gaje ije nsukwra-achi, Ihe-nb͕um di kwa na ncherita-irum mb͕e nile. 18 N'ihi na m'gēgosi ajọ omumem; M'gēcheb͕u onwem bayere nmehiem. 19 Ma ndi-irom nādi ndu, nwe ume: Ha ba-kwa-ra uba, bú ndi nākpọm asì n'uzọ okwu-ugha. 20 Ndi ahu kwa nke nākwughachi ihe ọjọ n'ọnọdu ezi iheNēmegidem, n'ihi na anamab͕aso ezi ihe. 21 Arapulam, Jehova: Chinekem, anọlam n'ebe di anya. 22 Bia ọsọsọ iyerem ka, Onye-nwe-ayi, bú nzọputam.

Abù Ọma 39

1 Asirim, Ka m'lezie uzọm nile anya, Ka m'we ghara iwere irem mehie: Ka m'debere ọnum ihe ikechi ọnu, Mb͕e onye nēmebi iwu nọ n'irum. 2 Aghọrọm onye-ob͕i n'inọ-dū, ab͕aram nkiti, ọbuná ipu n'ikwu ezi ihe; Ewe kpalie ihe-nb͕um. 3 Obim di ọku nimem; Mb͕e m'nātughari uche ọku rebere: M'we were irem kwue okwu: 4 Jehova, me ka m'mara ọgwugwum, Na ọtùtù ubọchim nile, ihe ọ bu; Ka m mara ka msi buru ihe nākwusi akwusi. 5 Le, I mewo ubọchim nile dika ntu-ọbu-aka; Mb͕e ndum di kwa ka ihe nābughi ihe n'iru Gi: N'ezie nání otù nku-ume ka madu ọ bula bu, n'iguzosi-ike-ya. Selah 6 N'ezie ọ bu n'onyinyo ka madu nējeghari: N'ezie n'otù nku-ume ka ha nāb͕a aghara: Ọ nākwakọba àkù, ma ọ maghi onye gāchikọta ha. 7 Ma ub͕u a, Onye-nwe-ayi, m'leworo anya gini? Ncherem, n'ebe I nọ ka ọ di. 8 Naputam n'aka njehiem nile: Emelam ka m'buru ihe-ita-uta nke onye-nzuzu. 9 Aghọrọm onye-ob͕i, adighm-asaghe ọnum; N'ihi na Gi onwe-gi mere ya. 10 Si n'arum wezuga ihe-otiti-Gi: Emewo ka mu onwem gwusia site n'ilu-ọ̀gù nke aka-Gi. 11 I ji iba-nba nile dọ madu aka na nti n'ihi ajọ omume, I we me ima-nma-ya anāchọsi ike ka ọ b͕aze dika nla: N'ezie nání otù nku-ume ka madu ọ bula bu. Selah 12 Nuru ekperem, Jehova, ṅa kwa nti ntikum; Ab͕ala nkiti n'anya-mirim: N'ihi na ọbìa ka m'bu n'ebe I nọ, Abum onye-nnọdu, dika nnam-hà nile. 13 Lepum anya, ka m'we b͕asa irum, Tutu mu ala, ghara inọ kwa ọzọ n'uwa.

Abù Ọma 40

1 Elesirim anya Jehova ike; Ọ we tọrọm nti-Ya n'ala, nu ntikum. 2 Ọ we me ka m'si n'olùlù nbibi, n'apiti nke ala urọ, rigoputa; Ọ we me ka ukwum abua guzo n'elu nkume di elu, Ọ nēme ka nzọ-ukwum nile guzosie ike. 3 Ọ we tiye abù ọhu n'ọnum, bú otuto diri Chineke-ayi: Ọtutu madu gāhu ya, tua egwu, We tukwasi Jehova obi. 4 Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú nwoke nke meworo Jehova ka Ọ buru ihe-ntukwasi-obi-ya, Ọ cheghi kwa ndi-nganga iru, ma-ọbu ndi nējehi n'uzọ okwu-ugha. 5 Ọtutu ihe ka Gi onwe-gi meworo, Jehova, bú Chinekem, bú oké ọlu-Gi nile, Na èchìchè-Gi nile n'ebe ayi nọ: Apughi idoro Gi ha n'usoro; Asi na agamegosi kwu kwa okwu bayere ha, Ha kariri igu-ọnu. 6 Àjà na onyinye-inata-iru-ọma adighi-atọ Gi utọ; Nti abua ka I ràpúworom: Ọ bughi àjà-nsure-ọku na àjà-nmehie ka I chọworo. 7 Mb͕e ahu ka M'siri, Le, abiawom; N'akwukwọ-npiakọta ka edeworo ihe bayerem: 8 Ime ihe di Gi utọ atọwom utọ, Chineke; Iwu-Gi di kwa nime obim. 9 Ezisawom ozi ọma nke ezi omume nime nkpọkọta-Gi bara uba; Le, adighm-eb͕ochi eb͕ub͕ere-ọnum abua, Jehova, Gi onwe-gi amawo. 10 Ekpuchighm ezi omume-Gi nime obim; Ekwusawom ikwesi-ntukwasi-obi-Gi na nzọputa-Gi: Ezonarighm nkpọkọta-Gi bara uba ebere-Gi na ezi-okwu-Gi 11 Gi onwe-gi, Jehova, ebochilaram obi-ebere-Gi nile: Ka ebere-Gi na ezi-okwu-Gi nēchezim mb͕e nile. 12 N'ihi na ihe ọjọ nādighi ọnu-ọgugu ab͕awom buruburu, Ajọ omumem nile eruwom aru, apughkwam ihu uzọ; Ha kariri agiri-isi nile nke isim n'uba, obim arapuwokwam. 13 Jehova, ka ọ tọ Gi inaputam: Jehova, bia ọsọsọ iyerem aka. 14 Ka ihere me ha, ka ha nile nwe kwa iru-ihere n'otù, Bú ndi nāchọ nkpuru-obim ikpochapu ya: Ka ha laghachi azu, ka etiye kwa ha n'ọnọdu-ihere, Bú ndi ihe ọjọ dakwasirim nātọ utọ. 15 Ka ha tọb͕ọrọ n'efu n'ihi ihere-ha, Bú ndi nāsim, Ehe, ehe. 16 Ka obi tọ ndi nile nke nāchọ Gi utọ, ka ha ṅuri kwa ọṅu nime Gi: Ka ndi nāhu nzọputa-Gi n'anya nāsi mb͕e nile, Ka Jehova di uku. 17 Ma mu onwem bu onye ewedara n'ala na ob͕eye; Ma Onye-nwe-ayi nēchèrem èchìchè: Onye-iye-akam na Onye nēme ka m'b͕apu ka I bu; Chimekem, anọla ọdù.

Abù Ọma 41

1 Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú onye nwere uche n'imeso onye nēnweghi ike: N'ubọchi ihe ọjọ Jehova gēme ka ọ wepuga onwe-ya. 2 Jehova gēdebe ya, me ka ọ di ndu, agēme ka ihe gara ya nke-ọma n'uwa; Enye-kwa-la ya n'aka ọchichọ nkpuru-obi nke ndi-iro-ya. 3 Jehova gākwagide ya n'elu ihe o ji edina mb͕e aru nādighi ya ike: Ihe-ndina-ya nile ka I b͕anweworo n'ọria ya. 4 Mu onwem siri, Jehova, merem amara: Me ka nkpuru-obim diri ndu; n'ihi na emehiewom megide Gi. 5 Ndi-irom nēkwu ihe ọjọ bayerem, si. Òle mb͕e ọ gānwu, aha-ya ewe la n'iyì? 6 Ọ buru kwa na ọ bia ihum, ihe-efu ka ọ nēkwu; Obi-ya nāchikọtara onwe-ya ajọ ihe: Ọ nāpu n'èzí nēkwu ya. 7 Ndi nile nke nākpọm asì nātakwurita ntakwu imegidem: N'imegidem ka ha nēchèrem ihe ọjọ. 8 Anāwukwasi ya ihe jọb͕uru onwe-ya, ka ha kwuru: E, nke o dinaworo ub͕u a ọ gaghi-ebili ọzọ. 9 Ọbuná nwoke nke mu na ya di n'udo, onye m'tukwasiri obi, onye nēri nrim, Ọ mewo ikiri-ukwu-ya ka ọ di uku imegidem. 10 Ma Gi onwe-gi, Jehova, merem amara, me ka m'bilie, Ka m'we kwughachi ha ugwọ. 11 Nka ka m'ji mara na ihem nātọ Gi utọ, N'ihi na onye-irom adighi-eti nkpu nmeri n'arum. 12 Ma mu onwem, n'izu-okèm ka I jideworom, We me ka m'guzosie ike n'iru Gi rue mb͕e ebighi-ebi. 13 Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke Israel, bu, Site na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi. Amen, na Amen.

AKWUKWỌ NKE-ABUA

Abù Ọma 42

1 Dika agu iyi miri si agu nne-ele, Otú a ka agu Gi nāgu nkpuru-obim, Chineke. 2 Akpiri Chineke, bú Chineke di ndu, akpọwo nkpuru-obim nku: Òle mb͕e m'gābia, ewe hum n'iru Chineke? 3 Anya-mirim aghọworom nri ehihie na abali, Mb͕e ha nāsim ogologo ubọchi nile, Òle ebe Chineke-gi nọ? 4 Ihe ndia ka m'gēcheta, wusi kwa nkpu tu-obim nimem dika miri, Otú m'nāgabiga n'etiti ìgwè madu, nējere ha nwayọ dika onye-ndú-ha rue ulo Chineke, N'olu iti-nkpu-ọṅù na nke ekele, bú ìgwè madu nēme ememe. 5 Gini mere i ji ruda n'ala, nkpuru-obim? Gini mere i ji su ude nke-uku nimem? Chere Chineke: n'ihi na m'gēkele kwa Ya ọzọN'ihi nzọputa nile nke iru-Ya. 6 Chinekem, nimem ka nkpuru-obim nēruda n'ala: N'ihi ya anamecheta Gi site n'ala Jọdan, Site kwa na Heamon, site n'ugwu Miza. 7 Ob͕u-miri nākpọ ob͕u-miri òkù n'olu nrùda-miri nile nke Gi: Ebili-miri-Gi nile na nmali-miri-Gi nile agabigawo n'isim. 8 N'ehihie Jehova gēnye ebere-Ya iwu, N'abali kwa ka abù-Ya gādi n'onum, Bú ekpere m'nēkpere Chineke nke ndum. 9 Ka m'si Chineke, bú nkumem di elu, N'ìhi gini ka I chezọworom? N'ìhi gini ka m'nējeghari nēyi uwe-nkpe nime nmeb͕u onye-iro? 10 Dika asi na eji ihe gwepia ọkpukpum nile, ndi nākpab͕um nātam uta; Mb͕e ha nāsin ogologo ubọchi nile, Òle ebe Chineke-gi nọ? 11 Gini mere i ji ruda n'ala, nkpuru-obim? Gini mere i ji su ude nke-uku nimem? Chere Chineke: n'ihi na m'agēkele kwa Ya ọzọ, Onye bu nzọputa nke irum, na Chinekem.

Abù Ọma 43

1 Kpem ikpe, Chineke, kpe kwa ọnum n'ikpe, me ka m'pua n'aka mba nādighi-eme ebere: Me ka m'si n'aka nwoke bu onye-aghughọ na onye ajọ omume b͕apu. 2 N'ihi na Gi onwe-gi bu Chineke Nke bu ebem siri ike; n'ìhi gini ka I juworom aju? N'ihi gini ka m'nējeghari nēyi uwe-nkpe nime nmeb͕u onye-iro? 3 Ziputa ìhè-Gi na ezi-okwu-Gi; ka ha onwe-ha nēdum: Ka ha me ka m'biarue ugwu nsọ Gi, Biaru kwa ebe-obibi-Gi nile. 4 M'gābiaru kwa ebe-ichu-àjà nke Chineke, Rue Chineke aru, bú ọṅù nke otite-egwú-ọṅùm: M'gēkele kwa Gi n'ubọ-akwara, Chineke, bú Chinekem. 5 Gini mere i ji ruda n'ala, nkpuru-obim? Gini mere i ji su ude nke-uku nimem? Chere Chineke: n'ihi na m'gēkele kwa Ya ọzọ, Onye bu nzọputa nke irum, na Chinekem.

Abù Ọma 44

1 Chineke, ayi ewerewo nti-ayi nu, nna-ayi-hà akọworo ayi, Ọlu I luru n'ubọchi-ha, n'ubọchi mb͕e ochie. 2 Gi onwe-gi jiri aka-gi napu mba ọzọ di iche iche ala-ha, we kua ha dika osisi nime ya; I nēmejọ ndi nile di iche iche, we me ka nna-ayi-hà wasa alaka. 3 N'ihi na ọ bughi mma-agha-ha ka ha ji nweta ala ahu, Ogwe-aka-ha azọputaghi kwa ha: Kama ọ bu aka-nri-Gi, na ogwe-aka-Gi, na ìhè nke iru-Gi, N'ihi na ihe-ha tọrọ Gi utọ. 4 Gi onwe-gi bu Ezem, Chineke: Nye nzọputa nile nke Jekob iwu. 5 Site na Gi ka ayi ga-akwatu ndi nākpab͕u ayi: Site n'aha-Gi ka ayi gāzọkwasi ndi nēbili imegide ayi ukwu. 6 N'ihi na ọ bughi utam ka m'nātukwasi obi, Mma-agham adighi-azọputakwam. 7 Kama ọ bu Gi zọputaworo ayi n'aka ndi nākpab͕u ayi, I mewo kwa ka ihere me ndi nākpọ ayi asì. 8 Chineke ka ayi jiworo nya isi ogologo ubọchi nile, Ọ bu kwa aha-gi ka ayi gēkele rue mb͕e ebighi-ebi. Selah 9 Ma ub͕u a I juwo ayi aju, we tiye ayi n'ọnọdu-ihere; I dighi-eso kwa usu-ndi-agha-ayi pua ije agha. 10 I nēme ka ayi si n'iru onye-nkpab͕u laghachi azu: Ọzọ, ndi nākpọ ayi asì nāpunara ayì ihe nye onwe-ha. 11 I nēme ayi ka ayi di ka ìgwè aturu agēri eri; N'etiti mba nile ka I fesawo-kwa-ra ayi. 12 I nēre ndi-Gi ma I naraghi ihe-ọnu-ahia, I meghi ka àkù-Gi ba uba site n'ọnu-ahia-ha. 13 I nēme ayi ka ayi ghọro ndi-ab͕ata-obi-ayi ihe-ita-uta, Ka ayi ghọrọ ndi di ayi buruburu ihe-ọchì na ihe-ikwa-emò. 14 I nēme ayi ilu n'etiti mba nile, Nfufe-isi n'etiti ndi nile di iche iche. 15 Ogologo ubọchi nile ka onodu-iherem di n'irum, Ihere irum ekpuchiwokwam, 16 N'ihi olu ita-uta na onye-nkwulu; N'ihi onye-iro na onye nābọ̀ ọ́bọ̀. 17 Ihe nile a abiakwasiwo ayi; ma ayi echezọghi Gi, Ayi ekwughi kwa okwu-ugha n'ọb͕ub͕a-ndu-Gi 18 Obi-ayi alaghachighi azu, Nzọ-ukwu-ayi esighi kwa n'uzọ-Gi wezuga onwe-ha; 19 Na I gwepiawo ayi n'ọnọdu nkita-ọhia, Were kwa onyinyo ọnwu kpuchie ayi. 20 Ọ buru na ayi echezọwo aha Chineke-ayi, We b͕asapuru chi ala ọzọ ọbu-aka-ayi; 21 Chìneke agaghi-egwuputa ala ihe a? N'ihi na Ya onwe-ya mara ihe-nzuzo nile nke obi. 22 N'ezie n'ihi Gi ka eb͕uworo ayi ogologo ubọchi nile; Aguwo ayi dika ìgwè ewu na aturu agēb͕u eb͕u. 23 Teta, n'ìhi gini ka I nāraru ura, Onye-nwe-ayi? Teta n'ura, ajula ayi aju rue mb͕e ebighi-ebi. 24 N'ìhi gini ka I nēzobe iru-Gi? N'ìhi gini ka I nēchezọ nweda-n'ala-ayi na nmeb͕u-ayi? 25 N'ihi na nkpuru-obi-ayi erudawo n'ala rue ájá: Afọ-ayi araparawo n'ala. 26 Bilie iyere ayi aka, B͕aputa kwa ayi n'ihi ebere-Gi.

Abù Ọma 45

1 Obim ab͕ọputawo okwu di nma: Mu onwem nēkwu okwu; olum diri eze: Irem bu pen nke onye nēde akwukwọ ngwa ngwa. 2 Emewo gi ka i ma nma kari umu madu; Awukwasiwo amara n'eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua: N'ihi ya Chineke agọziwo gi rue mb͕e ebighi-ebi. 3 Ke mma-agha-gi n'úkwù-gi, gi dike, Ebube-gi na ima-nma-gi. 4 N'ima-nma-gi nọkwasi n'elu inyinya ga nke-ọma, N'ihi ezi-okwu na ume-ala-n'obi na ezi omume: Aka-nri-gi gēzí kwa gi ihe di iche iche di egwu. 5 Àkú-gi nile bu ihe di nkọ; Ndi nile di iche iche nāda n'okpuru gi; Àkú-gi di n'obi ndi-iro eze. 6 Oche-eze-Gi, Chineke, nādiru mb͕e nile ebighi-ebi: Nkpa-n'aka-eze nke izi-ezi ka nkpa-n'aka-eze nke ala-eze-Gi bu. 7 I huwo ezi omume n'anya, we kpọ nmebi-iwu asì: N'ihi nka Chineke, bú Chineke-gi, tere giManu obi-utọ n'isi kari ndi-ibe-gi. 8 Myrrh na aloes na cassia juputara uwe-gi nile; Site n'ulo uku nile nke ọdu ubọ-akwara emewo ka i ṅuria ọṅu. 9 Umu-ndinyom ndi-eze muru nọ n'etiti ndinyom-i di oké ọnu-ahia: Nwunye-eze nēguzo onwe-ya n'aka-nri-gi yiri ọla-edo ọma nke Ofia. 10 Nuru, ada, le kwa, tọ kwa nti-gi n'ala; Chezọ kwa ndi-gi, na ulo nna-gi; 11 Eze gēsi otú a chọsie ima-nma-gi ike: N'ihi na ya onwe-ya bu onye-nwe-gi; gi kpọ kwa isi ala nye ya. 12 Ada Taia gēwere kwa onyinye-inata-iru-ọma bia; Ndi-ọgaranya nke ndi-gi gēme ka iru-gi dajua. 13 Ada eze nke nọ nime ulo dichasi nsọpuru: Ihe akpagwara ọla-edo ka uwe-ya bu. 14 N'uwe akpara nke-ọma ka agēduru ya jekuru eze: Umu-ab͕ọghọ, nāmaghi nwoke ndi nēso ya n'azu, bú ndi-ibe-ya, Anēme ha ka ha biakute gi. 15 Eji ọṅù na otite-egwú-ọǹù duru ha: Ha gābà n'ulo uku eze. 16 Umu-gi gānọchi anya nna-gi-hà, I gēdo ha ndi-isi n'uwa nile. 17 M'gēme ka echeta aha-gi n'ọb͕ọ nile: N'ihi nka ndi nile di iche iche gēkele gi rue mb͕e nile ebighi-ebi.

Abù Ọma 46

1 Chineke buru ayi ebe-nb͕abà na ike, O mewo ka achọta Ya n'iye aka nke-uku na nkpab͕u nile. 2 N'ihi nka ayi agaghi-atu egwu mb͕e uwa nāb͕anwe, Ma-ọbu mb͕e anēwezuga ugwu nile n'ọnọdu-ha ga n'etiti oké osimiri; 3 Mb͕e miri-ya nāb͕a aghara nāsu kwa ufufu, Mb͕e ugwu nile nēme nkpatu site na nbili-elu ya. Selah 4 Otù osimiri di, miri-iyi-ya nile nēme ka obodo Chineke ṅuria ọṅu, Bú ebe nsọ nke ebe-obibi nile nke Onye kachasi ihe nile elu. 5 Chineke nọ n'etiti ya; agaghi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya: Chineke gēyere ya aka mb͕e chi bọrọ. 6 Mba nile ozo b͕ara aghara, ewezugara ala-eze nọnọdu-ha: O mere ka olu-Ya da, uwa nabaze. 7 Jehova nke usu nile nke ndi-agha nọyere ayi; Chineke nke Jekob buru ayi ulo-elu. Selah 8 Jenu, hu ọlu nile nke Jehova, Onye doworo ihe-iju-anya di iche iche n'uwa, 9 Nēme ka agha nile kwusi rue nsọtu uwa; Ọ nāb͕aji uta, b͕upia kwa ube; Ọ nēsure ub͕ọ-ala nile n'oku. 10 Ranu aka, mara kwa na Mu onwem bu Chineke: Agēbulim n'etiti mba nile, agēbulim n'uwa. 11 Jehova nke usu nile nke ndi-agha nọyere ayi; Chineke nke Jekob buru ayi ulo-elu. Selah

Abù Ọma 47

1 Unu ndi nile di iche iche, kuanu aka; Werenu olu nke iti-nkpu-ọṅu tikue Chineke. 2 N'ihi na Jehova, Onye kachasi ihe nile elu, di egwu; Ọ bu Eze uku nāchi uwa nile. 3 Ọ nēdu ndi nile di iche iche bia n'okpuru ayi, Ọ nēdu kwa mba nile bia n'okpuru ukwu-ayi. 4 Ọ nārọputara ayi ihe-nketa-ayi, Bú nbili-elu nke Jekob, onye Ọ huru n'anya. Selah 5 Chineke ewerewo iti-nkpu rigo, Jehova ewerewo olu opì-ike rigo. 6 Bùkuenu Chineke abù ọma, bùkuenu Ya abù ọma: Bùkuenu Eze-ayi abù ọma, bùkuenu Ya abù ọma. 7 N'ihi na Eze nke uwa dum ka Chineke bu: Bùkuenu Ya abù ọma, maschil. 8 Chineke aghọwo eze mba nile: Chineke anọkwasiwo n'oche-eze nsọ Ya. 9 Ndi amara aha-ha nke ndi nile di iche iche achikọtawo onwe-haIbu ndi Chineke nke Abraham: N'ihi na Chineke nwe ọta nile nke uwa; Emewo ka Ọ di elu nke-uku.

Abù Ọma 48

1 Onye uku ka Jehova bu, Ọ bu kwa onye anēto nke-uku, N'obodo Chineke-ayi, bú ugwu nsọ Ya. 2 Ihe mara nma n'idi-elu, na ihe-obi-utọ nke uwa nile, Ka ugwu Zaion bu, n'akuku nile nke Ugwu, Bú obodo Eze ukwu. 3 Chineke Nke nọ n'ulo nile ya di elu emewo ka amara Ya na Ya bu ulo-elu. 4 N'ihi na, le, ndi-eze zukọro, Ha gabigara n'otù. 5 Ha onwe-ha huru ya, ibobo we nwua ha n'aru; Ha mara jijiji, zọlie ọsọsọ. 6 Ọma-jijiji jidere ha n'ebe ahu; Ihe-nb͕u, dika nke nwayi nāmuputa nwa. 7 I ji ifufe Iru-anyanwuTiwa ub͕ọ nile nke Tashish. 8 Dika ayi nuworo, otú a ka ayi huworoN'obodo Jehova nke usu nile nke ndi-agha, n'obodo Chineke-ayi: Chineke gēme ka o guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi. Selah 9 Ayi echèwo ebere-Gi echè, Chineke, N'etiti ulo uku Gi. 10 Dika aha-Gi si di, Chineke, Otú a ka otuto-Gi di rue nsọtu nile nke uwa: Ezi omume juputara aka-nri-Gi. 11 Ka ugwu Zaion ṅuria ọṅu, Ka umu-ndinyom Juda tegharia egwú ọṅù, N'ihi ikpé-Gi nile. 12 Jenu Zaion buruburu, b͕a kwa ya buruburu: Guanu ulo-elu-ya nile ọnu. 13 Tukwasinu obi-unu n'ékpè-ya, Tulenu ulo nile ya di elu; Ka unu we kọrọ ọb͕ọ nēso n'azu. 14 N'ihi na Nka bu Chineke, bú Chineke-ayi, rue mb͕e nile ebighi-ebi; Ya onwe-ya ganēdu ayi rue n'inwu-ọnwu.

Abù Ọma 49

1 Nurunu nka, ndi nile di iche iche; Ṅanu nti, ndi nile bi n'uwa nka: 2 Ma ndi di ala ma ndi di elu, Ọgaranya na ob͕eye n'otù. 3 Ọnum gēkwu okwu amam-ihe nile; Ntughari-uche nke obim gābu kwa nghọta nile. 4 M'gātọ ntim n'ala n'ilu: M'gēkpughepu okwu-omimim n'ubọ-akwara. 5 N'ìhi gini ka m'gātu egwu n'ubọchi ihe ọjọ, Mb͕e ajọ omume nke ndi nējidem n'ikiri-ukwu dim buruburu, 6 Bú ndi nātukwasi obi n'àkù-ha, Nānya kwa isi n'iba-uba nke ọgaranya ha bu? 7 Ọ dighi onye ọ bula gāb͕aputa nwa-nne-ya ma-ọli, Ọ gaghi-enye Chineke ihe-nb͕aputa-ya: 8 (N'ihi na nb͕aputa nkpuru-obi-ha di oké ọnu-ahia, Ọ gāra kwa ya aka rue mb͕e ebighi-ebi: ) 9 Ka o we digide ndu rue mb͕e ebighi-ebi, Ghara ihu nbibi anya. 10 N'ihi na ọ gāhu ya: ndi-amam-ihe gānwu, N'otù ka onye-nzuzu na onye bu anu-ọhia nālakọ n'iyì, We rapuru ndi ọzọ àkù-ha. 11 Èchìchè-obi-ha bu, na ulo-ha gādiru mb͕e ebighi-ebi, Ebe-obibi-ha rue ọb͕ọ nile; Ha ewerewo aha-ha kpọkwasi ala nile ha. 12 Ma madu adighi-anọgide na nsọpuru: O yiri anu nke emeworo ka ha debe ọnu-ha du n'ọnwu. 13 Uzọ-ha nka buru ha nzuzu: Ma mb͕e ha gasiri okwu-ọnu-ha nātọ madu utọ. Selah 14 Dika ìgwè ewu na aturu, ọ bu ala-mọ ka edoworo ha nye; Ọnwu gābu onye nāzù ha dika aturu: Ndi ziri ezi gēnwe ike n'aru ha n'ututu; Udi-ha bu ihe ala-mọ gēme ka ọ ka nká, ka ebe-obibi ghara idiri ya. 15 Otú ọ di, Chineke gāb͕aputa nkpuru-obim n'aka ala-mọ: N'ihi na Ọ gēkurum la. Selah 16 Atula egwu mb͕e madu nēme ọgaranya, Mb͕e nsọpuru nke ulo-ya nāba uba: 17 N'ihi na mb͕e ọ nwuru ọ gaghi-ewere ihe ahu nile la; Nsọpuru-ya agaghi-arida so ya. 18 N'ihi na mb͕e ọ di ndu ọ nāgọzi nkpuru-obi-ya, Madu nēkele kwa gi mb͕e i nēmere onwe-gi ezi ihe. 19 Ọ gābakuru ọb͕ọ nna-ya-hà; Rue mb͕e ebighi-ebi ha agaghi-ahu ìhè. 20 Madu nke nọ na nsọpuru, ma ọ dighi-aghọta ihe, Yiri anu emeworo ka ha debe ọnu-ha du n'ọnwu.

Abù Ọma 50

1 Chineke Nke kachasi chi nile, bú Jehova, ekwuwo, We kpọ uwa site n'ọwuwa anyanwu rue ọdida-ya. 2 Site na Zaion, bú ebe mazuru nma, Ka Chineke nwuputaworo ka ìhè. 3 Ka Chineke-ayi bia, Ya ab͕a-kwa-la nkiti: Ọku nēripia n'iru Ya, Buruburu Ya ka ifufe nēfesi kwa ike nke-uku. 4 Ọ nākpọ elu-igwe nke di n'elu òkù, Nākpọ kwa uwa, ka O we kpe ndi-Ya ikpe: 5 Chikọtaranum ndi-eberem; Bú ndi Mu na ha b͕ara ndu n'elu àjà. 6 Elu-igwe nēgosi kwa ezi omume-Ya; N'ihi na Chineke onwe-ya nēkpe ikpe. Selah 7 Nuru, ndim, M'gēkwu kwa; Nuru, Israel, M'gāb͕a kwa àmà megide gi: Chineke, bú Chineke-gi, ka M'bu. 8 Ọ bughi n'ihi àjà-gi nile ka M'nābara gi nba; Àjà-nsure-ọku-gi nile di kwa n'irum mb͕e nile. 9 M'gaghi-anara oke-ehi n'ulo-gi, M'gaghi-anara nkpi ọ bula n'ogige-ewu-na-aturu-gi. 10 N'ihi na Mu nwe anu-ọhia ọ bula nke oké ọhia, Ya na anu nile n'elu nnù ugwu abua na ọgu iri. 11 Amawom anu-ufe ọ bula nke ugwu nile: Anu nile nke nēnughari n'ọhia di kwa n'akam. 12 Ọ buru na agu aguam, M'gaghi-agwa gi: N'ihi na Mu nwe elu-uwa dum madu bi na ùjú-ya. 13 M'gēri anu oke-ehi? Ọ̀ bu ọbara nkpi ka m'gāṅu? 14 Chuara Chineke ekele dika àjà; Kwughachi kwa Onye kachasi ihe nile elu nkwa nile i kwere: 15 Kpọkukwam n'ubọchi nkpab͕u; M'gādọputa gi, i gāsọpu-kwa-ram. 16 Ma ndi nēmebi iwu ka Chineke gwara okwu, si, Òle ọlu-gi di ya n'ikọ ukpurum nile? Òle ọlu-gi di kwa ya na i būruwo ọb͕ub͕a-ndum n'ọnu-gi? 17 Ebe gi onwe-gi kpọworo idọ-aka-na-nti asì, We tufue okwum nile n'azu gi. 18 Ọ buru na i hu onye-ori, ihe-ya we tọ gi utọ, Gi na ndi nākwa iko ekèkọwo kwa òkè. 19 I rarawo ọnu-gi nye n'ikwu ihe ọjọ, Ire-gi nējikọta kwa aghughọ. 20 I nānọdu ala, nwa-nne-gi ka i nēkwu okwu megide; Nwa nke nne-gi muru ka i nēbo ebubo ugha. 21 Ihe ndia ka i meworo, M'we b͕a nkiti; I chère na adizum ka i di: M'gābara gi nba, do kwa ya n'usoro n'anya-gi. 22 Biko, ghọtanu nka, unu ndi nēchezọ Chineke, Ka m'we ghara idọka unu, ọ dighi kwa onye-nnaputa diri unu: 23 Onye nāchu ekele dika àjà nāsọpurum; Ọ bu kwa onye nēdozi uzọ-yaKa m'gēme ka ọ hu nzọputa Chineke.

Abù Ọma 51

1 Merem amara, Chineke, dika ebere-Gi si di: Dika iba-uba nke obi-ebere-Gi nile si di hichapu njehiem nile. 2 Sucham nke-ọma dika ákwà ka ajọ omumem pua nimem, Me kwa ka m'si na nmehiem di ọcha. 3 N'ihi na mu onwem mara njehiem nile: Nmehiem di kwa n'irum mb͕e nile. 4 Megide Gi, nání Gi, ka m'mehieworo, Ọ bu kwa ihe jọrọ njọ n'anya-Gi ka m'meworo: Ka I we buru onye ezi omume mb͕e I nēkwu okwu, Di kwa ọcha n'obi mb͕e I nēkpe ikpe. 5 Le, n'ajọ omume ka amuputaram; Ọ bu kwa na nmehie ka nnem turu imem. 6 Le, ezi-okwu n'akuku nile di nime madu atọwo Gi utọ: Ọ bu kwa n'akuku zoro ezo ka i nēme ka m'mara amam-ihe. 7 I gēwere hyssop wepu nmehiem, m'gādi kwa ọcha: I gāsucham dika ákwà, m'gādi kwa ọcha kari snow. 8 I gēme ka m'nuru olu obi-utọ na ọṅù; Ka ọkpukpu nile I gwepiaworo we tegharia egwú-ọṅù. 9 Zopu iru-Gi na nmehiem nile, Hichapu kwa ajọ omumem nile. 10 Kèrem obi di ọcha, Chineke; Me kwa ka mọ nke nēguzosi ike di ọhu nimem. 11 Atupulam n'iru Gi; Anara-kwa-lam Mọ Nsọ Gi. 12 Nyeghachim obi-utọ nke nzọputa-Gi: Were kwa mọ nke amara aha-ya kwagidem. 13 M'gēzí ndi-njehie uzọ-Gi nile; Ndi-nmehie gālaghachikute kwa Gi. 14 Naputam n'aka ikpe-ọmuma ọbara di iche iche, Chineke, bú Chineke nke nzọputam; Irem gēti nkpu ọṅù bayere ezi omume-Gi. 15 Onye-nwe-ayi, I gēmeghe eb͕ub͕ere-ọnum abua; Ọnum gēgosi kwa otuto-Gi. 16 N'ihi na àjà adighi-atọ Gi utọ; ka m'we nye ya: Àjà-nsure-ọku adighi-atọ Gi utọ. 17 Àjà nile nke Chineke bu mọ tiwara etiwa: Obi tiwara etiwa na nke egwepiara egwepia, Chineke, I dighi-eleda ya anya. 18 Mere Zaion nma dika o si di Gi utọ: I gālu mb͕idi nile nke Jerusalem. 19 Mb͕e ahu ka àjà nile nke ezi omume, bú àjà-nsure-ọku na àjà-nsuresi-ọku, gātọ Gi utọ: Mb͕e ahu ka ha gāchu ọtutu oke-ehi n'elu ebe-ichu-àjà-Gi.

Abù Ọma 52

1 Gini mere i nēto onwe-gi n'ihe ọjọ, gi dike? Ebere Chineke nādigide ogologo ubọchi nile. 2 Ihe-ila-n'iyì di iche iche ka ire-gi nēchè; Dika aguba di nkọ, nālu ọlu aghughọ. 3 I huwo ihe ọjọ n'anya kari ezi ihe; Na okwu-ugha kari ikwu okwu ezi omume. Selah 4 I huwo okwu nile nēloda eloda n'anya, Gi ire aghughọ. 5 Chineke gākwatu kwa gi rue mb͕e ebighi-ebi, Ọ gējide gi, dọkpupu gi n'ulu-ikwū-gi, Ropu kwa gi n'ala ndi di ndu. Selah 6 Ndi ezi omume gāhu kwa ya we tua egwu, Chì kwa ya ọchi, si, 7 Le, nwoke nke nādighi-eme Chineke ebe-ya siri ike; Kama ọ tukwasiri obi n'uba nke àkù-ya, Ọ di ike n'ọchichọ ọjọ ya. 8 Ma mu onwem, adim ka osisi olive nwere akwukwọ ndu n'ulo Chineke: Atukwasiwom obi n'ebere Chineke rue mb͕e nile ebighi-ebi. 9 M'gēkele Gi rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi na I meworo ya: M'gēle kwa anya aha-Gi, n'ihi na ọ di nma, niru ndi-ebere-Gi.

Abù Ọma 53

1 Onye-nzuzu asiwo n'obi-ya, Ọ dighi Chineke ọ bula di. Ha ebibiwo onwe-ha, ha emewo ka ajọ omume-ha buru ihe-árú; Ọ dighi onye nēme ezi ihe. 2 Chineke siri n'elu-igwe lekwasi umu madu anya, Ihu ma ọ di onye nwere uche, Nke nāchọ Chineke. 3 Ha nile n'otù n'otù alaghachiwo azu; ha ab͕aruwo n'otù dika miri; Ọ dighi onye nēme ezi ihe, ọ dighi ọbuná otù onye. 4 Ndi nālu ajọ ihe, hà amaghi ihe? Bú ndi riworo nri site n'iri ndim, Ma ha akpọkughi Chineke. 5 N'ebe ahu ka ha turu oké egwu, n'ebe oké egwu nādigh: N'ihi na Chineke esesawo ọkpukpu nke onye nāma ulo-ikwū-ya imegide gi; I mewo ka ihere me ha, n'ihi na Chineke ajuwo ha. 6 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na nzọputa Israel esi na Zaion puta! Mb͕e Chineke gēji me ka ndọta-n'agha ndi-Ya lata, Ka Jekob tegharia egwú ọṅù, ka Israel ṅuria ọǹu.

Abù Ọma 54

1 Chineke, were aha-Gi zọputam, Were kwa idi-ike-Gi kpem ikpe. 2 Chineke, nuru ekperem; Ṅa nti n'okwu nile nke ọnum. 3 N'ihi na ndi ala ọzọ ebiliwo imegidem, Ndi nēme ka madu ma jijiji achọwo kwa nkpuru-obim: Ha edoghi Chineke n'iru ha. Selah 4 Le, Chineke bu onye nēyerem aka: Onye-nwe-ayi nọ n'etiti ndi nākwagide nkpuru-obim. 5 Ọ gēnyeghachi ndi nēchem anwu ihe ọjọ ha: Were ezi-okwu-Gi kpochapu ha. 6 M'gēji onyinye-afọ-ofufo churu Gi àjà: M'gēkele aha-Gi, Jehova, n'ihi na ọ di nma. 7 N'ihi na ọ bu na nkpab͕u nile ka Ọ naputaworom; Anyam elekwasiwo kwa ndi-irom.

Abù Ọma 55

1 Ge nti n'ekperem, Chineke; Ezonari-kwa-la Onwe-gi n'aririọ-amaram. 2 Ṅam nti, zam: Anamalù ulù na ntughari-obim, nāsu kwa oké ude; 3 N'ihi olu onye-iro, N'ihi nkpab͕u nke onye nēmebi iwu; N'ihi na ha nēme ka ajọ ihe me nkpatu megidem, Ọ bu kwa n'iwe ka ha nākpọm asì. 4 O nēb͕usi nkpuru-obim nb͕u ike nimem: Oké ujọ nile nke ọnwu adakwasiwo-kwam. 5 Egwu na ima-jijiji nābiarum aru, Oké ọma-jijiji ekpuchiwokwam. 6 M'we si, Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na enwerem nkù dika nduru! M'gēfela, we nọdu du. 7 Le, m'gēferu ebe di anya, Nọ ọnọdu-abali n'ọzara. Selah 8 M'gēwere ọsọsọ si n'ifufe siri ike na n'oké ifufeBiarue ebe-nb͕apu dirim. 9 Onye-nwe-ayi, loda ha, kesa ire-ha: N'ihi na ahuwom ihe-ike na ilu-ọ̀gù n'obodo. 10 N'ehihie na abali ka ha nāb͕a ya buruburu n'elu mb͕idi-ya nile: Ma ajọ ihe ma nmeb͕u di n'etiti ya. 11 Ihe-ila-n'iyì di iche iche di n'etiti ya: Nzọb͕u na aghughọ adighi-esi kwa n'amá-ya nile. 12 N'ihi na ọ bughi onye-iro nātam uta; M'gānagide kwa ya: Ọ bughi onye nākpọm asì mere onwe-ya uku megidem; M'gēzonari kwa ya onwem: 13 Kama ọ bu gi onwe-gi, onye mu na gi ra, Eyìm, na onye m'mara nke-ọma. 14 Ayi nāb͕akọri ìzù utọ, N'ulo Chineke ka ayi nējeghari n'etiti ìgwè madu. 15 Ka ọnwu biakwasi ha na mberede, Ka ha ridarue ala-mọ na ndu: N'ihi na ihe ọjọ nile di n'ebe ha nọ dika ọbìa, n'etiti ha. 16 Ma mu onwem, Chineke ka m'gākpọku; Jehova gāzọputakwam. 17 Anyasi, na ututu, na etiti-ehihie, ka m'gātughari uche, su kwa oké ude: Ọ gānu kwa olum. 18 Ọ b͕aputawo nkpuru-obim me ka ọ ba n'udo, ka ha ghara ibiarum nso: N'ihi na ha bara uba, bú ndi mu na ha nālu ọ̀gù. 19 Chineke gānu olum, weda kwa ha n'ala, Bú Onye nānọdu ka eze site na mb͕e ochie. SelahHa bu ndi nēnweghi nb͕anwe, Ha adighi-atu kwa egwu Chineke. 20 O setiwo aka-ya abua imegide ndi ya na ha nọ n'udo: O mewo ọb͕ub͕a-ndu-ya ka ọ ghara idi nsọ. 21 Ha bu okwu ire-utọ, bú okwu ọnu-ya nke di ka miri-ara raru araru, Ma nání agha ka obi-ya bu: Okwu-ya nile di nrò kari manu, Ma okwu ahu bu mma-agha amiputara amiputa. 22 Tukwasi Jehova ihe O nyeworo gi dika ibu, Ya onwe-ya gānagide kwa gi: Ọ gaghi-ekwe ka ewezuga onye ezi omume n'ọnọdu-ya rue mb͕e ebighi-ebi 23 Ma Gi onwe-gi, Chineke, gēme ka ha rida n'olùlù nbibi: Ndi bu ndi-ọbara na ndi-aghughọ agaghi-adiru nkera ubọchi-ha; Ma mu onwem gātukwasi obi na Gi.

Abù Ọma 56

1 Merem amara, Chineke; n'ihi na madu ekusiwo ume ike ilom: Ogologo ubọchi nile ka o nēbu agha nēmeb͕um. 2 Ndi nēchem anwu nēkusi ume ike ilom ogologo ubọchi nile: N'ihi na ha bara uba bú ndi nēbu agha imegidem n'ibuli onwe-ha elu. 3 N'ubọchi m'nātu egwu, Mu onwem, ọ bu Gi ka m'gātukwasi obi. 4 Nime Chineke ka m'gēto okwu-Ya: Ọ bu Chineke ka m'tukwasiworo obi, m'gaghi-atu egwu; Gini ka anu-aru, bú madu, gēmem? 5 Ogologo ubọchi nile ka ha nāhighari okwum nile: N'imegidem èchìchè nile ha bu ime ihe ọjọ. 6 Ha nēzukọ, nēzobe onwe-ha, Ndi ahu nēlezi ikiri-ukwum abua anya, Dika ha leworo anya nkpuru-obim. 7 Ọ̀ bu n'ihi ajọ ihe ka ha nāb͕apu? N'iwu-Gi me ka ndi nile di iche iche rida, Chineke. 8 Nwagharim ka Gi onwe-gi guworo ọnu: Tiye anya-mirim nile nime karama-akpukpọ-Gi; Hà adighi n'akwukwọ-Gi: 9 Mb͕e ahu ndi-irom gālaghachi azu n'ubọchi m'gākpọku Gi: Nka ka m'mara, na Chineke dirim. 10 Nime Chineke ka m'gēto okwu-Ya: Nime Jehova ka m'gēto okwu-Ya. 11 Ọ bu Chineke ka m'tukwasiworo obi, m'gaghi-atu egwu; Gini ka anu-aru, bú madu, gēmem? 12 N'isim, Chineke, ka nkwa nile m'kwere Gi di: M'gākwughachi Gi ekele nile. 13 N'ihi na I naputawo nkpuru-obim n'ọnwu: Ì naputaghi ukwum abua na nnuda anēnudam? Ka m'we nējeghari n'iru ChinekeN'ihè ndi ndu.

Abù Ọma 57

1 Merem amara, Chineke, merem amara; N'ihi na nime Gi ka nkpuru-obim b͕abàworo: Ọ bu kwa na ǹdò nke nkù-Gi abua ka m'gāb͕abà, Rue mb͕e ihe-ila-n'iyì ndia gāgabiga. 2 M'gākpọku Chineke Onye kachasi ihe nile elu; M'gākpọku Chineke Onye nēmezurum ihe. 3 O gēsi n'elu-igwe zìe, zọputam, Mb͕e onye nēkusi ume ike ilom nāta uta; SelahChineke gēziputa ebere-Ya na ezi-okwu-Ya. 4 Nkpuru-obim nọ n'etiti ọdum; M'gēdina n'etiti ndi nēre ọku, Bú umu madu, ndi ezé nile ha bu ube na àkú, Ire-ha bu kwa mma-agha di nkọ. 5 Me Onwe-gi ka I di elu n'elu elu-igwe nile, Chineke; Ka ebube-Gi di elu n'elu uwa nile. 6 Ub͕u ka ha doziworo nzọ-ukwum nile; Nkpuru-obim erudawo n'ala: Ha egwuwo olùlù n'irum; Ha adabàwo n'etiti ya. Selah 7 Edoziwo obim Chineke, edoziwo obim: M'gābù abù, e, m'gābù abù ọma. 8 Teta, nsọpurum; teta, une na ubọ-akwara: M'gākpọte chi-ọbubọ. 9 M'gēkeli gi n'etiti ndi nile di iche iche, Onye-nwe-ayi: M'gābùku Gi abù ọma n'etiti mba nile. 10 N'ihi na ebere-Gi di uku rue elu-igwe, Ezi-okwu-Gi di kwa uku rue mbara-ígwé. 11 Me Onwe-gi ka I di elu n'elu elu-igwe nile, Chineke; Ka ebube-Gi di n'elu uwa nile.

Abù Ọma 58

1 Ọ̀ bu ezie na ezi omume nke kwesiri ka unu kwue bu ob͕i? Ùnu ji izi-ezi kpe ikpe, unu umu madu? 2 É-è, kama ọ bu nime obi ka unu nēme ajọ omume nile; Unu nātùzi ihe-ike nke aka-unu n'uwa. 3 Emewo ka ndi nēmebi iwu buru ndi ala ọzọ site n'àkpà-nwa: Ha akpafuwo site n'afọ nne-ha, nēkwu okwu-ugha. 4 Edide ha nwere yiri edide agwọ: Ha di ka aju-ala nke nti chiri nke nākpọchi nti-ya; 5 Nke nādighi-ege nti olu nke ndi nārà agwọ, Ma-ọbu nke dibia nārafu arafu, bú onye emeworo ka ọ mara ihe. 6 Chineke, tijie ezé nile ha n'ọnu-ha: Tikwopu ezé uku nile nke umu-ọdum, Jehova. 7 Ka ha b͕aze dika miri nke nērùghariri onwe-ya: Mb͕e o nēdo àkú-ya nile, ka ha di ka anēbipu ọnu-ha. 8 Ka ha di ka ejula nāga nāb͕aze, Dika nwa nwanyi mukworo amukwo, dika ndi ọ dighi mb͕e ha huru anyanwu. 9 Tutu ite-unu amata ọku ogwu, Ma ihe di ndu ma ihe di ọku, Ọ nēfepusi ha ike dika oké ifufe. 10 Onye ezi omume gāṅuri mb͕e ọ huru ọ́bọ̀ ahu: Ọ gāsa nzọ-ukwu-ya nile n'ọbara onye nēmebi iwu. 11 Madu gāsi kwa, N'ezie nkpuru diri onye ezi omume: N'ezie Chineke di Nke nēkpe ikpe n'uwa.

Abù Ọma 59

1 Naputam n'aka ndi-irom, Chinekem: Me ka m'si n'aka ndi nēbili imegidem nọ n'ebe di elu. 2 Naputam n'aka ndi nālu ajọ ihe, Zọputakwam n'aka ndi-ọbara. 3 N'ihi na, le, ha echewo nkpuru-obim anwu; Ndi di ike nēzukọ imegidem: Ọ bughi n'ihi njehiem, ọ bughi kwa n'ihi nmehiem, Jehova. 4 Mb͕e ọ nādighi ajọ omume m'mere ha nāb͕a ọsọ, dozie onwe-ha: Kpọte Onwe-gi izutem, hu kwa. 5 Gi onwe-gi kwa, Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke Israel, Teta ileta mba nile: Emelera ndi nāghọ aghughọ n'ajọ ihe amara. Selah 6 Ha nālaghachi n'anyasi, nāb͕ọ uja dika nkita, Nāga obodo buruburu. 7 Le, ha ji ọnu-ha nāsuputa okwu; Mma-agha di n'eb͕ub͕ere-ọnu-ha: N'ihi na ònye nānu? bu ihe ha kwuru. 8 Ma Gi onwe-gi, Jehova, gāchì ha ọchì; I gākwa mba nile emò. 9 Ikem, Gi ka m'gēlezi anya: N'ihi na Chineke bu ulo-elum. 10 Chineke nke eberem gābia izutem: Chineke gēme ka m'lekwasi ndi nēchem anwu anya. 11 Eb͕ula ha, ka ndim ghara ichezọ: Were usu-ndi-agha-Gi me ka ha nāṅaghari, me kwa ka ha rida, Onye-nwe-ayi, bú ọta-ayi. 12 Nmehie nke ọnu-ha ka okwu nke eb͕ub͕ere-ọnu-ha bu; Ka anwude kwa ha nime npako-ha, Na n'ihi ọb͕ub͕a-iyi na n'ihi okwu-ugha nke ha nākọ akukọ-ha. 13 Me ka ha gwusia n'ọnuma-Gi, me ka ha gwusia, ka ha ghara idi ọzọ: Ka ha mara kwa na Chineke nāchi achi nime Jekob, Rue nsọtu nile nke uwa. Selah 14 Ha nālaghachi kwa n'anyasi, nāb͕ọ uja dika nkita, Nāga obodo buruburu. 15 Ndi ahu nāṅaghari iri ihe, Ọ buru na afọ ejughi ha ha gānọ kwa ọnọdu-abali. 16 Ma mu onwem gābù abù bayere ike-Gi; E, m'gēti nkpu ọṅù bayere ebere-Gi n'ututu: N'ihi na I buruworom ulo-elu, Na ebe-nb͕alaga n'ubọchi nkpab͕u dirim. 17 Ikem, Gi ka m'gābùku abù ọma: N'ihi na Chineke bu ulo-elum, bú Chineke nke eberem.

Abù Ọma 60

1 Chineke, I juwo ayi aju, I tiwawo ayi, I wewo iwe; I gēme ka ayi laghachi ọzọ. 2 I mewo ka ala ma jijiji; I b͕awawo ya: Mezie ntiwa-ya nile; n'ihi na o mewo nkpatu. 3 I mewo ka ndi-Gi hu ihe siri ike: I mewo ka ayi ṅua manya nke isu-ngọngọ. 4 I nyewo ndi nātu egwu Gi ọkọlọtọ, Ka ewe welie ya elu dika ọkọlọtọ n'ihi ezi-okwu. Selah 5 Ka ewe dọputa ndi I huru n'anya, Were aka-nri-Gi zọputa, za kwa ayi. 6 Chineke ekwuwo okwu n'di-nsọ-Ya; ka m'ṅuria ọṅu-agha: M'gēkè Shekem, tù kwa ndagwurugwu Sukot. 7 Mu nwe Gilead, ọ bu kwa mu nwe Manase; Efraim bu kwa ebe siri ike nke isim; Juda bu nkpa-n'aka-ezem. 8 Moab bu ite ọsisa-arum; N'elu Edom ka m'gātu akpukpọ-ukwum: Filistia, tie nkpu n'ihim. 9 Ònye gēdubàm nke-ọma n'obodo ewusiri ike? Ònye duruworom rue Edom? 10 Ọ̀ bughi Gi onwe-gi, Chineke, juworo ayi aju? I dighi-apu kwa ije agha n'etiti usu nile nke ndi-agha ayi, Chineke. 11 Yere ayi aka ka ayi pua n'aka onye-nkpab͕u: N'ihi na ihe-efu ka nzọputa madu bu. 12 Nime Chineke ayi ga-eme ihe dìnkpà: Ọ bu kwa Ya onwe-ya gāzọda ndi nākpab͕u ayi

Abù Ọma 61

1 Chineke, nuru olu iti-nkpum; Ṅa nti ekperem. 2 M'nēsi na nsọtu uwa kpọkue Gi, mb͕e, obim nādighi ike: Rue n'oké nkume nke kam elu ka I gēdurum je. 3 N'ihi na I buworom ebe-nb͕abà, Ulo-elu di ike ipu n'iru onye-iro. 4 Ka m'nọ dika ọbìa n'ulo-ikwū-Gi rue mb͕e nile ebighi-ebi: M'gāb͕abà n'ebe-nzuzo nke nkù-Gi abua. Selah 5 N'ihi na Gi onwe-gi, Chineke, egewo nti nkwa nile m'kwere: I werewo ihe-nnweta nke ndi nātu egwu aha-Gi nye ha. 6 I gātukwasi ọtutu ubọchi n'ubọchi ndu eze: Arọ-ya nile gādi ka ọtutu ọb͕ọ. 7 O gēbi n'iru Chineke rue mb͕e ebighi-ebi: Wezuga ebere na ezi-okwu, ka ha we nēchezi ya. 8 Otú a m'gābùku aha-Gi abù ọma rue mb͕e ebighi-ebi, Ka m'we kwughachi nkwam nile kwa-ubọchi.

Abù Ọma 62

1 Ọ bu nání Chineke ka nkpuru-obim nēdere du: N'aka-Ya ka nzọputam si bia. 2 Nání Ya onwe-ya bu oké nkumem na nzọputam: Ọ bu ulo-elum; agaghi-ewezugam n'ọnọdum ri nne. 3 Rùe ole mb͕e ka unu ganāwagide madu? Unu nētipia ya, unu nile, Dika mb͕idi ruru eruru, dika ogige nke anēnuda enuda. 4 Ọ bu nání isi na nbuli-elu-ya nupu ya ka ha b͕aworo ìzù; Okwu-ugha nātọ ha utọ: Ha nēji ọnu-ha agọzi, ma n'ime obi-ha ha nākọcha akọcha. Selah 5 Nēdere nání Chinek du, nkpuru-obim; N'ihi na ọ bu Ya ka olile-anyam si puta. 6 Nání Ya onwe-ya bu oké nkumem na nzọputam: Ọ bu ulo-elum; agaghi-ewezugam n'ọnọdum. 7 N'ebe Chineke nọ ka nzọputam na nsọpurum di: Oké nkume nke ikem, bú ebe-nb͕abàm, di nime Chineke. 8 Tukwasinu Ya obi na mb͕e nile, unu ndi-Ya; Wusinu obi-unu n'iru Ya dika miri: Chineke buru ayi ebe-nb͕abà. Selah 9 Nání otù nku-ume ka ndi di ala bu, ọ bu kwa okwu-ugha ka ndi di elu bu: N'ihe-ọtùtù ha gàrigo elu dika ihe nfe; Ndi ahu nile n'otù di nfe kari otù nku-ume. 10 Unu atukwasila obi na nmeb͕u, Ọzọ, n'ipunara madu ihe unu aghọla ihe-efu: Mb͕e àkù nābakari uba, unu atukwasila ya obi. 11 Otù ub͕ò ka Chineke kwuworo okwu, Ub͕ò abua ka m'nuworo nka; Na ike nile bu ihe Chineke nwere: 12 Ọ bu kwa Gi nwe ebere, Onye-nwe-ayi: N'ihi na Gi onwe-gi nākwughachi madu ọ bula dika ọlu-ya si di.

Abù Ọma 63

1 Chineke, ọ bu Chinekem ka I bu; anamachọsi Gi ike: Akpiri Gi akpọwo nkpuru-obim nku, anu-arum achọsiwo Gi ike, N'ala ọkpọ-nku na nke ida-#mbà, ebe miri nādighi. 2 Otú a ka m'lekwasiworo Gi anya n'ebe nsọ gi, Ihu ike-Gi na nsọpuru-Gi. 3 N'ihi na ebere-Gi di nma kari ndu; Eb͕ub͕ere-ọnum abua gāja Gi. 4 Otú a ka m'gāgọzi Gi mb͕e m na-ādi ndu: N'aha-Gi ka m'gāchili akam elu. 5 Afọ nēju nkpuru-obim dika agāsi na o rijuru umi-anu na abuba afọ; Ọ bu kwa eb͕ub͕ere-ọnu nke nēti nkpu ọṅù ka ọnum nēji to Gi; 6 Ọ buru na echetam I n'elu utem, Nime nche-abali nile ka m'nātughari uchem na Gi. 7 N'ihi na I buworom iye-aka, Ọ bu kwa n'okpuru ǹdò nke nkù-Gi abua ka m'nēti nkpu ọṅù. 8 Nkpuru-obim nārapara Gi n'aru n'iso Gi n'azu: Mu ka aka-nri-gi jideworo. 9 Ma ndi ahu, ọ bu ime ka ọ la n'iyì ka ha nāchọ nkpuru-obim, Ha gābà n'ebe nile di ala nke uwa. 10 Agarara ha nye n'aka mma-agha: Òkè nke nkita-ọhia ka ha gābu. 11 Ma eze gāṅuri na Chineke: Onye ọ bula nke nēwere Ya ṅu iyi gānya isi; N'ihi na agēkpuchi ọnu nke ndi nēkwu okwu-ugha.

Abù Ọma 64

1 Chineke, nuru olum n'itughari-uchem: Nēchezi ndum ka ọ pua n'oké egwu nke onye-iro. 2 I gēzopum n'ìzù nzuzo nke ndi nēme ihe ọjọ: N'ìgwè ndi nālu ajọ ihe: 3 Ndi muworo ire-ha dika mma-agha, Ha edowo àkú-ha, bú okwu di ilu: 4 Ib͕a onye zuru okè àkú n'ebe nzuzo di iche iche: Na mberede ka ha nāb͕a ya, ha adighi-atu kwa egwu. 5 Ha nēme okwu ọjọ ka ọ diri ha ike; Ha nākọ akukọ bayere isi ọnyà na nzuzo; Ha siri, Ònye gāhu ha? 6 Ha nāchọputa ajọ omume nile, si, Ayi emezuwo nchọputa achọputara nke-ọma: Ọzọ, èchìchè-ime nke madu ọ bula nime ha na obi-ya miri emi. 7 Ma Chineke nāb͕a ha àkú; Na mberede ka ntib͕u nile ha bu. 8 Ewe me ka ha su ngọngọ, ebe ire nke aka ha nēmegide ha: Ha nēfufe isi, bú onye ọ bula nke nēlekwasi ha anya. 9 Madu nile gātu kwa egwu; We gosi ọlu Chineke, Were uche chè èchìchè bayere omume-Ya. 10 Onye ezi omume gāṅuri na Jehova, b͕abà kwa nime Ya; Ndi nile ndi ziri ezi n'obi gānya kwa isi.

Abù Ọma 65

1 Gi ka otuto nēdere du, Chineke, nime Zaion: Ọ bu kwa Gi ka anākwughachi nkwa ekwere. 2 Gi Onye nānu ekpere, Gi ka anu-aru nile, bú madu, gābiakute. 3 Okwu nile nke ajọ omume nile dikaririm ike: Njehie nile ayi, Gi onwe-gi gēkpuchi ha. 4 Ihe nāgara ya nke-ọma, bú onye I nārọputa, Onye I nēme kwa ka ọ biarue nso, Ka o we biri n'ogige-Gi nile: Ka afọ ju ayi n'ezi ihe nke ulo-Gi, Bú ebe nsọ nke ulo uku Gi. 5 Ihe di egwu ka I nēji za ayi n'ezi omume, Chineke nke nzọputa-ayi; Gi Onye bu ihe-ntukwasi-obi nke nsọtu nile nke uwa, Na nke oké osimiri, bú ebe di iche iche di anya: 6 Onye nēji ike-Ya me ka ugwu nile guzosie ike; Ebe ewerewo idi-ike ke Ya n'úkwù: 7 Onye nēme ka nkpọtu oké osimiri dajua, bú nkpọtu nmali-miri-ha, Ya na ùzù nke mba nile. 8 Ndi bi na nsọtu nile nke uwa we nātu egwu ihe-iriba-ama nile gi: I nēme ka ọpupu nile nke ututu na anyasi tie nkpu ọǹù. 9 I letawo ala, we me ka o juputa n'ihe, I nēme ka ọ nwe àkù ri nne; Miri-iyi Chineke juputara na miriI nēdozi ọka-ha, mb͕e I si otú a dozie ala onwe-ya. 10 I nēdè ọ̀b͕à-ala-ubi-ya miri: I nēme ka ebe elu ya nile di lari: I nēji oké miri-ozuzo b͕aze ya; I nāgọzi ihe-opupú-ya. 11 I kpubewo arọ nke ezi ihe-Gi okpu-eze; Uzọ-Gi nile nātasasi kwa abuba. 12 Ha nātasa n'ebe-ita-nri niile nke ọzara: Anēji kwa otite-egwú-ọṅù ke ugwu ntà nile n'úkwù. 13 Ewerewo igwè ewu na aturu yikwasi ebe-ita-nri nile dika uwe; Anēwere ọka kpuchie ndagwurugwu nile; Ha nēti nkpu ọǹù, e, ha nābù abù.

Abù Ọma 66

1 Tikusienu Chineke nkpu ọǹù ike, uwa nile: 2 Bùanu nsọpuru aha-Ya n'abù ọma: Menu ka otuto-Ya di nsọpuru. 3 Sinu Chineke, Le ka ọlu-Gi nile si di oké egwu! N'uba nke ike-Gi ndi-iro-Gi gērube isi aghugho n'okpuru Gi. 4 Uwa nile gākpọ isi ala nye Gi, Bùku kwa Gi abù ọma; Ha gābùku aha-Gi abù ọma. Selah 5 Jenu, hu ọlu nile nke Chineke; Onye di egwu ka Ọ bu n'omume-Ya n'ebe umu madu nọ. 6 Ọ b͕anwere oké osimiri ka ọ ghọ ala-akọrọ: Ha nāgabiga osimirí n'ukwu-ha: Ka ayi ṅuria nime Ya n'ebe ahu. 7 O ji idi-ike-Ya achi rue mb͕e ebighi-ebi; Anya-Ya abua nēche mba nile nche: Ka ndi nēwezuga onwe-ha ghara ibuli onwe-ha elu. Selah 8 Gọzienu Chineke-ayi, unu ndi nile di iche iche, Me-kwa-nu ka anu olu otuto-Ya: 9 Onye na-etinye nkpuru-obi-ayi nime ndu, Ọ kweghi kwa ka ewezuga ukwu-ayi n'ọnọdu-ha. 10 N'ihi na I nwawo ayi, Chineke: I nuchawo ayi, dika esi anucha ọla-ọcha. 11 I mere ka ayi ma n'ọnyà; I tukwasiwo n'úkwù-ayi ibu nānyib͕u ayi. 12 I mewo ka madu rikwasi inyinya gabiga n'elu isi-ayi; Ayi bàra n'ọku na nime miri; I we me ka ayi puta ba n'inwebiga-ihe-ókè. 13 M'gēji ọtutu àjà-nsure-ọku ba n'ulo-Gi, M'gākwughachi Gi nkwam nile m'kwere Gi, 14 Nke eb͕ub͕ere-ọnum abua ji saghepu, Nke ọnum kwu-kwa-ra, mb͕e nkpà dirim. 15 Ọtutu àjà-nsure-ọku, bú anu nwere abuba, ka m'gēsurere Gi, Ha na ihe-nsure-ọku nke nēsì ísì utọ nke ebulu; M'gāchu oke-ehi n'àjà, ha na nkpi. Selah 16 Bianu, nuru, unu nile ndi nātu egwu Chineke, M'gākọ kwa akukọ bayere ihe O meworo nkpuru-obim. 17 Ya ka m'jiri ọnum kpọkue, Nbuli-elu di kwa n'okpuru irem. 18 Ọ buru na ọ bu ajọ ihe ka m'leworo anya nime obim, Onye-nwe-ayi agaghi-anu olum: 19 N'ezie Chineke anuwo olum; Ọ ṅawo nti olu ekerem. 20 Onye agọziri agọzi ka Chineke bu, Onye nēwezugaghi ekperem, O sighi kwa n'ebe m'no wezuga ebere-Ya.

Abù Ọma 67

1 Ka Chineke mere ayi amara, gọzie ayi, Me ka iru-Ya mua n'ebe ayi nọ; Selah 2 Ka ewe mara uzọ-Gi n'uwa, Mara nzọputa-Gi n'etiti mba nile. 3 Ka ndi nile n'uwa kele Gi, Chineke; Ka ndi nile n'uwa kele Gi, ha nile. 4 Ka mba nile ṅuria, ti kwa nkpu ọṅù: N'ihi na I gēkpe ndi nile n'uwa ikpe ziri ezi, Mba nile n'uwa ka I gēdu kwa. Selah 5 Ka ndi nile n'uwa kele Gi, Chineke; Ka ndi nile n'uwa kele Gi, ha nile. 6 Ala emewo ihe-ọmume-ya: Chineke, bú Chineke-ayi, gāgọzi ayi. 7 Chineke gāgọzi ayi; Nsọtu nile nke uwa gātu kwa egwu Ya.

Abù Ọma 68

1 Ka Chineke bilie, ka ndi-iro-Ya b͕asa; Ka ndi nākpọ Ya asì si n'iru Ya b͕alaga. 2 Dika ifufe si efesa anwuru-ọku, otú a ka I gēfesa ha: Dika wax si ab͕azepu n'iru ọku, Otú a ka ndi nēmebi iwu gēsi n'iru Chineke la n'iyì. 3 Ma ka ndi ezi omume ṅuria; ka obi tọ ha utọ n'iru Chineke: E, ka ha wulie elu n'ọṅù. 4 Bùkuenu Chineke abù, bùkuenu aha-Ya abù ọma: Tulierenu Ya uzọ, bú Onye nānọkwasi inyinya gabiga n'ala ihe nādighi; Aha-Ya bu JA; ṅuri-kwa-nu ọṅu-agha n'iru Ya. 5 Nna nke umu-nb͕ei, na onye-ikpe nke ndinyom di-ha nwuru, Ka Chineke bu n'ebe-obibi-Ya di nsọ. 6 Chineke nēme ndi nání ha nọ ka ha biri n'ulo: Ọ nēme ka ndi-nkpọrọ puta ba n'ebe ihe nāgara ha nke-ọma: Ma ndi nēwezuga onwe-ha bi n'ala kpọrọ nku. 7 Chineke, mb͕e I putara ga n'iru ndi-Gi, Mb͕e I zọbigara ije n'ala tọb͕ọrọ n'efu; Selah 8 Ala mara jijiji, Ọzọ, elu-igwe buru miri n'iru Chineke: Sainai ahu mara jijiji n'iru Chineke, bú Chineke nke Israel. 9 Miri-ozuzo, bú onyinye-afọ-ofufo, ka I nēfesa, Chineke, Mb͕e ike gwuru ihe-nketa-Gi, Gi onwe-gi mere ka o guzosie ike. 10 Usu ndi nke Gi ebiriwo nime ya: I nēdoziri ndi ewedara n'ala ihe n'idi-nma-Gi, Chineke. 11 Onye-nwe-ayi nēnye okwu: Ndinyom ndi nēzisa ozi ahu bu usu bara uba. 12 Ndi-eze nke usu nile nke ndi-agha nāb͕alaga, ha nāb͕alaga: Nwayi bi n'ulo nēkèsa kwa ihe akwatara n'agha. 13 Ọ buru na unu edina n'etiti ogige-aturu, Ma ọ di ka nkù abua nke nduru nke ejiworo ọla-ọcha kpuchie, Ejiwo kwa ọla-edo ọma nēnwu akwukwọ ndu akwukwọ ndu kpuchie nkù-ya abua. 14 Mb͕e Onye Nke puru ime ihe nile chusara ndi-eze nime ya, Snow nēzò na Zalmon. 15 Ugwu Chineke ka ugwu Beshan bu; Ugwu nwere ugwu di iche iche n'elu ya ka ugwu Beshan bu. 16 Unu ugwu nwere ugwu n'elu unu, n'ìhi gini ka unu ji ekworoLe ugwu ahu anya nke Chineke chọsiworo ike ibu ebe-obibi-Ya? E, Jehova gēbi nime ya rue mb͕e ebighi-ebi. 17 Ub͕ọ-ala Chineke di orú nnú uzọ abua na nnù iri, ha di nnù abua na ọgu iri uzọ nādighi iguta ọnu: Onye-nwe-ayi nọ n'etiti ha, Sainai di nime ebe nsọ Ya. 18 I rigoruwo n'ebe di elu; dọta usu ndi adọtara n'agha n'agha; I natawo onyinye di iche iche n'etiti madu, E, ọbuná n'etiti ndi nēwezuga onwe-ha, ka Ja, bú Chineke, we biri n'etiti ha. 19 Onye agọziri agọzi ka Onye-nwe-ayi bu, kwa-ubọchi ka Ọ nēburu ayi ibu, Bú Chineke Nke bu nzọputa-ayi. Selah 20 Chineke buru ayi Chineke nāzọputa azọputa; Ọ bu kwa Johova, bú Onye-nwe-ayi, nwe uzọ nile isi n'ọnwu pua. 21 Ọ bu nání na Chineke gēb͕upú isi ndi-iro-Ya, Bú opu-n'isi arapuru ndundu nke onye nējeghari n'ikpe-ọmuma-ya. 22 Onye-nwe-ayi siri, M'gēme ka ha si na Beshan lata, M'gēme ka ha si n'ebe nile di omimi nke oké osimiri lata: 23 Ka I we b͕aye ukwu-gi n'ọbara, Ka ire nkita-gi nile we si n'aru ndi-iro-gi kère òkè-ya. 24 Ha ahuwo ojije-Gi nile, Chineke, Bú ojije nile nke Chinekem, bú Ezem, n'idi-nsọ-Ya. 25 Ndi-abù buru uzọ ga, ndi-ubọ-akwara soro n'azu, N'etiti umu-ab͕ọghọ ndi nēti egwú-otiti. 26 Nime nkpọkọta nile nke madu gọzienu Chineke, Bú Onye-nwe-ayi, unu ndi sitere n'isi-iyi Israel. 27 N'ebe ahu ka ọ nọ, bú Benjamin di ntà, nke nwere ike n'aru ha, Ya na ndi-isi Juda na ìgwè ndi-ha, Na ndi-isi Zebulum, na ndi-isi Naftali. 28 Chineke-gi enyewo ike-gi iwu: Di ike, Chineke, Gi Onye luworo ayi ọlu. 29 N'ihi ulo uku Gi nime JerusalemỌ bu Gi ka ndi-eze gēdukuru ùtú. 30 Basiere anu-ọhia nke amì nba ike, Ìgwè oke-ehi, ha na umu-ehi nke ndi nile di iche iche, Onye ọ bula nime ha nēkwe ka azọtọ ya n'ukwu nēweta iberibe ọla-ọcha; Ọ chusawo ndi nile di iche iche ndi ilu-ọ̀gù nātọ utọ. 31 Ndi amara aha-ha gēsi n'Ijipt puta; Etiopia gēsetiri Chineke aka-ya abua ngwa ngwa. 32 Unu ala-eze nke uwa, bùkuenu Chineke abù; Bùkuenu Onye-nwe-ayi abù ọma; Selah 33 Bùkuenu Onye ahu Nke elu-igwe kachasi elu-igwe nile, nke di mb͕e ochie, nēbu dika inyinya; Le, Ọ nēme ka olu-Ya da udà, ọ bu olu ike. 34 Nyenu Chineke ike: N'elu Israel ka idi-elu-Ya di, Ike-ya di kwa na mbara-ígwé nile. 35 Onye anātu egwu ka Chineke bu site n'ebe nsọ Gi nile: Chineke nke Israel, Ya onwe-ya nēnye ndi-Ya ike na ume. Onye agọziri agọzi ka Chineke bu.

Abù Ọma 69

1 Zọputam, Chineke; N'ihi na miri abiaruwo nkpuru-obim. 2 Emikpuwom n'urọ nke ebe di omimi, ọ dighi kwa ebe-nguzo di: Abatawom na miri nke miri emi, miri nke nērù ọku ọku na-enudakwa m. 3 Adọb͕uwom onwem n'ọlu n'ikpọ-òkùm; akpiri akpọsiwom nku: Anyam abua adalawo n'isi, mb͕e m'nēchere Chinekem. 4 Ha di ọtutu kari agiri-isi nke isim, bú ndi nākpọm asì n'efu: Ha nwere ume, bú ndi nēkpochapum, ebe ha bu ndi-irom n'uzọ okwu-ugha: Mb͕e ahu ka m'nēnyeghachi ihe m'nānapugh n'ike. 5 Chineke, Gi onwe-gi amawo uchem b͕agọrọ ab͕agọ; Ezonarighi kwa Gi ikpe-ọmumam nile. 6 Ekwela ka ihere me ha n'ihim, bú ndi nēle anya Gi, Chineke, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha: Ekwela ka etiye ha n'ọnọdu-ihere n'ihim, bú ndi nāchọ Gi, Chineke nke Israel. 7 N'ihi na ọ bu n'ihi Gi ka m'būworo ita-uta; Ihere ekpuchiwo irum. 8 Aghọworom umu-nnem onye ala ọzọ, Ghọ-kwa-ra umu nnem muru onye mba ọzọ. 9 N'ihi na ekworo ulo-Gi eripiawom; Ita-uta nile nke ndi nāta Gi uta adakwasiwokwam. 10 M'we kwa ákwá n'obubu-ọnu nke nkpuru-obim, O we ghọrọm nání ihe-ita-uta. 11 Anameme kwa ka ákwà-nkpe buru uwem, M'we ghọrọ ha ilu. 12 Ndi nānọdu n'ọnu-uzọ-ama nātughari uche bayerem; Aghọwokwam abù nke ndi nāṅu ihe-ọṅuṅu nābà n'anya nābù n'ikpọ ubọ-akwara. 13 Ma mu onwem, anamekpere Gi ekpere, Jehova, na mb͕e ọ nātọ Gi utọ: Chineke, n'iba-uba nke ebere-Gi, Zam n'ezi-okwu nke nzọputa-Gi. 14 Naputam n'apiti, ekwe-kwa-la ka m'mikpùe. Kwe ka anaputam n'aka ndi nākpọm asì, ka anaputakwam na miri nke miri emi. 15 Ekwela ka miri nke nērù ọku ọku ṅachapum, Ekwe-kwa-la ka ebe di omimi lodam; Ekwe-kwa-la ka olùlù kpuchibidom ọnu-ya. 16 Zam, Jehova; n'ihi na ebere-Gi di nma: Dika iba-uba nke obi-ebere-Gi nile si di chem iru. 17 Ezonari-kwa-la orù-Gi iru-Gi; N'ihi na nkpà nākpam; me ngwa zam. 18 Biarue nkpuru-obim nso, b͕aputa ya: N'ihi ndi-irom b͕aputam. 19 Gi onwe-gi amawo ita-utam, na iherem, na ọnọdu-iherem: N'iru Gi ka ndi-nkpab͕um nile nọ. 20 Ita-uta etiwawo nkpuru-obim; anamariasi kwa ọria ike: M'we le anya onye gēgosim ebere o ji n'arum, ma ọ dighi onye ọ bula; M'le-kwa-ra anya ndi-nkasi-obi, ma achọtaghm onye ọ bula. 21 Ha we nyem ńsí di ilu ka ọ buru ihe-oririm; Ọzọ mb͕e akpiri kpọrọm nku ha nēme ka m'ṅua manya-vine b͕ara uka. 22 Me table-ha nke di n'iru ha ka ọ ghọ ib͕udu; Mb͕e ha nọ n'udo, ya ghọ kwa ọnyà. 23 Me ka anya-ha b͕a ọchichiri, ka ha we ghara ihu uzọ; Me kwa ka úkwù-ha nāma jijiji mb͕e nile. 24 Wukwasi ha iwe-Gi, Me kwa ka idi-ọku nke iwe-Gi rue ha aru. 25 Me ka ebe-ulo-ikwū-ha ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu; Ekwela onye ọ bula bi n'ulo-ikwū nile ha. 26 N'ihi na ọ bu onye Gi onwe-gi tib͕uworo ka ha sob͕uworo; Ọ bu kwa akukọ bayere ihe-nb͕u nke ndi I dupuworo ka ha nākọ. 27 Tukwasi ajọ omume n'ajọ omume-ha: Ekwe-kwa-la ka ha ba n'ezi omume-Gi. 28 Me ka ehichapu ha n'akwukwọ ndi di ndu, Ekwe-kwa-la ka edekọ ha na ndi ezi omume n'akwukwọ. 29 Ma mu onwem bu onye ewedara n'ala na onye ihe nēb͕u nb͕u: Chineke, nzọputa-Gi gētiyem n'ebe di elu. 30 M'gēji abù to aha Chineke, M'gēji kwa ekele me ka Ọ di uku. 31 Ọ gadi kwa Jehova mma kari ehi, Ma-ọbu oke-ehi nke nwere mpi, nke ukwu-ya wara njakpa. 32 Ndi di ume-ala n'obi ahuwo ya, ha nāṅuri: Unu ndi nāchọ Chineke, ka obi-unu di ndu. 33 N'ihi na Jehova nēge nti ndi-ob͕eye, Ọ ledaghi kwa ndi-nkpọrọ-Ya. 34 Ka elu-igwe na ala to Ya, Ha na oké osimiri, na ihe ọ bula nke nākpughari nime ha. 35 N'ihi na Chineke gāzọputa Zaion, wu kwa obodo nile nke Juda; Madu gēbi kwa n'ebe ahu, we nweta ya. 36 Nkpuru nke ndi-orù-Ya gēketa kwa ya; Ndi nāhu aha-Ya n'anya gēbi kwa nime ya.

Abù Ọma 70

1 Chineke, bia ọsọsọ inaputam; Jehova, bia ọsọsọ iyerem aka. 2 Ka ihere me ha, ka ha nwe kwa iru-ihere, Bú ndi nāchọ nkpuru-obim: Ka ha laghachi azu, ka etiye kwa ha n'ọnọdu-ihere, Bú ndi ihe ọjọ dakwasirim nātọ utọ. 3 Ka ha laghachi azu n'ihi ihere-ha, Bú ndi nāsi, Ehe, ehe! 4 Ka obi tọ ndi nile nke nāchọ Gi utọ, ka ha ṅuri kwa ọṅu nime Gi; E, ka ndi nāhu nzọputa-Gi n'anya nāsi mb͕e nile, Ka Chineke di uku. 5 Ma mu onwem bu onye ewedara n'ala na ob͕eye; Chineke, biakutem ọsọsọ: Onye-iye-akam na Onye nēme ka m'b͕apu ka I bu; Jehova, anọla ọdù.

Abù Ọma 71

1 Nime Gi, Jehova, ka m'b͕abàworo: Ekwela ka ihere mem rue mb͕e ebighi-ebi. 2 N'ezi omume-Gi naputam, me ka m'b͕apu: Tọrọm nti-Gi n'ala, zọputam. 3 Ghọrọm oké nkume nke ebe-obibi, nke m'gābà nime ya mb͕e nileI nyewo iwu izọputam; N'ihi na nkumem di elu na ebem ewusiri ike ka I bu. 4 Chinekem, me ka m'b͕apu n'aka onye nēmebi iwu, N'ọbu-aka nke onye nēme ajọ omume nke nēme kwa ihe-ike. 5 N'ihi na Gi onwe-gi bu olile-anyam, Onye-nwe-ayi Jehova: Gi bu ntukwasi-obim site na nwata. 6 N'elu Gi ka m'dabeworo site n'afọ nnem: Gi onwe-gi bu onye weputaworom n'afọ nnem: Na Gi ka otutom gādi mb͕e nile. 7 Aghọworom ọtutu madu ihe-ebube; Ma Gi onwe-gi bu ebe-nb͕abàm di ike. 8 Ọnum gējuputa n'otuto-Gi, Ogologo ubọchi nile ka ọ gējuputa kwa n'ima-nma-Gi. 9 Etufulam na mb͕e agadi; Mb͕e ikem gwusiri arapulam. 10 N'ihi na ndi-irom ekwuwo okwu bayerem; Ọzọ, ndi nēche nkpuru-obim nche ab͕aritawo ìzù, 11 Si, Chineke arapuwo ya: Chuanu ya, jide ya; n'ihi na ọ dighi onye-nnaputa di. 12 Chineke, anọlam ebe di anya: Chinekem, bia ọsọsọ iyerem aka. 13 Ka ihere me ha, ka eme kwa ka ha gwusia, bú ndi nēmegide nkpuru-obim; Ka ewere ita-uta na ọnọdu-ihere kpuchie ndi nāchọ imem ihe ọjọ. 14 Ma mu onwem, mb͕e nile ka m'ganēche Gi, We tukwasi otuto n'otuto-gi nile 15 Ọnum gākọ akukọ bayere ezi omume-Gi, Ogologo ubọchi nile ka ọ gākọ akukọ bayere nzọputa-Gi; N'ihi na amaghm ọnu-ọgugu nile ha. 16 M'gēji idi-ike nile nke Onye-nwe-ayi, bú Jehova, bia: M'gēhota ezi omume-Gi, nání nke Gi. 17 Chineke, I zíwom ihe site na nwata; Ọ bu kwa rue ub͕u a ka m'nēgosi oké ọlu-Gi nile. 18 Ọzọ, ọbuná ure agadi na isi-awọ arapulam, Chineke; Rue mb͕e m'gēgosi ọb͕ọ ọzọ ogwe-aka-GiGosi kwa onye ọ bula nke gābia idi-ike-Gi. 19 Ọzọ, ezi omume-Gi, Chineke, nādiru ebe di elu; Gi Onye meworo ihe uku di iche iche, Chineke, ònye di ka Gi? 20 Gi, Onye meworo ka ayi hu ọtutu nkpab͕u nke jọ-kwa-ra njọ, I gēme ka ayi di kwa ndu ọzọ, Me kwa ka ayi si n'ob͕u-miri nile nke uwa rigoputa ọzọ. 21 Me ka idi-ukum bakari uba, Gi chighari kwa kasiem obi. 22 Mu onwem gēji kwa une kele Gi, Bú ezi-okwu-Gi, Chinekem: M'gēji ubọ-akwara bùkue Gi abù ọma, Gi Onye Nsọ nke Israel. 23 Eb͕ub͕ere-ọnum abua gēti nkpu ọṅù mb͕e m'nābùku Gi abù ọma; Nkpuru-obim, nke I b͕aputaworo, gēti kwa nkpu ọṅù. 24 Ọzọ, irem ganēkwu okwu, dika onye nātughari uche, bayere ezi omume-Gi ogologo ubọchi nile: N'ihi na ihere emewo ha, n'ihi na ha nwere iru-ihere, bú ndi nāchọ imem ihe ọjọ.

Abù Ọma 72

1 Chineke, nye eze ikpé-Gi nile, Nye kwa nwa eze ezi omume-Gi. 2 O gēji ezi omume kpe ndi-Gi ikpe, O gēji kwa ikpe ziri ezi kpe ndi-Gi ewedara n'ala. 3 Ugwu nile gēbutere ndi-Gi udo, Ugwu ntà kwa, n'ezi omume. 4 Ọ gēkpe ndi ewedara n'ala n'etiti ndi-Gi ikpe, Ọ gēnye umu nke ob͕eye nzọputa, Zọpia kwa onye-nmeb͕u. 5 Ha ganātu egwu Gi ogologo mb͕e anyanwu gādigide, Na n'iru ọnwa, rue ọb͕ọ nile. 6 Ọ gārida dika miri-ozuzo si ezokwasi n'ọzara asuru asu: Dika oké miri-ozuzo nke nēdè ala. 7 Onye ezi omume gāma akwukwọ n'ubọchi nile ya dika osisi ndu; Ọtutu udo gādi kwa rue mb͕e ọnwa agaghi-adi. 8 Ya nwe kwa ike n'aru madu site n'otù oké osimiri rue oké osimiri ọzọ, Site kwa n'Osimiri rue nsọtu nile nke uwa. 9 Ndi bi n'ala kpọrọ nku gēruru ala n'iru ya; Ọzọ, ndi-iro-ya gāracha ájá. 10 Ndi-eze Tashish na nke ala nile di oké osimiri buruburu gēnye onyinye-inata-iru-ọma: Ndi-eze Sheba na Seba gēweta ùtú nso. 11 E, eze nile gākpọ isi ala nye ya: Mba nile gēfè ya òfùfè. 12 N'ihi na ọ gānaputa ob͕eye mb͕e o nētiku ya; Ọ gānaputa kwa onye ewedara n'ala mb͕e ọ dighi onye nēyere ya aka. 13 Ọ gēmere onye nēnweghi ike na ob͕eye ebere, Ọ bu kwa nkpuru-obi ndi-ob͕eye ka ọ gāzọputa. 14 Ọ gēsi n'aka nzọb͕u na n'aka ime-ihe-ike b͕aputa nkpuru-obi-ha; Ọbara-ha gādi kwa oké ọnu-ahia n'anya-ya. 15 Ya di kwa ndu! agēnye kwa ya ufọdu n'ọla-edo Sheba: Agēkpe kwa ekpere bayere ya mb͕e nile; Ogologo ubọchi nile ka agāgọzi ya. 16 Ka ọtutu ọka di n'ala n'elu ugwu nile; Nkpuru-ya ganēme nkpatu dika Lebanon: Madu gēsi kwa n'obodo wa okoko-osisi dika ihe akuru n'ala. 17 Ka aha-Ya dirue mb͕e ebighi-ebi; N'iru anyanwu ka aha-Ya gāmu ọmùmù: Madu gāgọzi kwa onwe-ha nime ya: Mba nile gākpọ ya onye ihe nāgara nke-ọma. 18 Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke, bu, bú Chineke nke Israel, Onye nání Ya nālu oké ọlu di iche iche: 19 Ihe agọziri agọzi ka aha nsọpuru Ya bu kwa rue mb͕e ebighi-ebi; Ka uwa nile juputa kwa na nsọpuru-Ya. Amen, na Amen. 20 Ekpere nke Devid nwa Jesi agwuwo.

AKWUKWỌ NKE-ATỌ

Abù Ọma 73

1 N'ezie Chineke di nma n'ebe Israel nọ, Bú n'ebe ndi di ọcha n'obi nọ. 2 Ma mu onwem, ọ fọduru nwantī ka ukwum abua wezuga onwe-ha; Nzọ-ukwum fọduru nke-ntà ka ha b͕uchapu. 3 N'ihi na ekwosorom ndi nānya isi ekworo, Ọ bu udo nke ndi nēmebi iwu ka m'nāhu. 4 N'ihi na ọ dighi nmekpa-aru ọ bula di n'ọnwu-ha: Ma aru-ha mara abuba. 5 Ha anọghi n'ahuhu madu ọzọ; Adighi-eti kwa ha ihe-otiti n'etiti madu nile. 6 N'ihi nka npako di ha buruburu dika iyab͕a-olu; Anēwere ime-ihe-ike kpuchie ha dika uwe. 7 Anya-ha esiwo n'abuba-ha guzoputa: Ntughari nile nke obi-ha agabigawo ókè. 8 Ha nākwa emò, nēkwu kwa okwu nmeb͕u n'ihe ọjọ: Ha nēsi n'ebe di elu kwu okwu. 9 Ha edowo ọnu-ha n'elu-igwe, Ire-ha nējeghari kwa n'uwa. 10 N'ihi nka ndi-Ya nālata n'ebe a, Ha nāmiputa-kwa-ra onwe-ha miri gēju afọ. 11 Ha we si, Chìneke si aṅa mara? Ọ̀ di kwa ọmuma-ihe di n'Onye kachasi ihe nile elu? 12 Le, ndia bu ndi nēmebi iwu; Ọzọ, ebe ha nānọgide n'udo mb͕e ebighi-ebi, ha emewo ka àkù-ha bùkari ibù. 13 Ọ bu nání n'efu ka m'meworo ka obim di ọcha, N'efu ka m'kwọworo ọbu-akam abua n'emeghi-ihe-ọjọ; 14 Buru kwa onye anēti ihe ogologo ubọchi nile, Onye iba-nbam di kwa-n'ututu. 15 Ọ buru na asiwom, M'gākọ akukọ otú a; Le, ọ bu ọb͕ọ nke umu-Gi ka m'gāghọb͕uwori. 16 M'we chè èchìchè imata nka, Ndọb͕u-onwem-n'ọlu ka ọ bu n'anyam; 17 Rue mb͕e m'nābà n'ebe nsọ nile nke Chineke, Ghọta ikpe-azu-ha. 18 N'ezie ọ bu n'ebe nile nālọ alọ ka I nēdo ha: I mewo ka ha darue ntikpọ. 19 Hà siri aṅa ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu n'otù ntabi-anya? Ha agwuwo gwusia site n'ihe-egwu di iche iche. 20 Dika nrọ mb͕e madu nēteta n'ura; Otú a, Onye-nwe-ayi, mb͕e I gākpọte Onwe-gi, I gēleda onyinyo-ha anya. 21 N'ihi na obim nāb͕ari uka, Ọ nādutukwam ogwu n'akurum abua. 22 Ma mu onwem bu anu-ọhia, amaghkwam ihe; Nání anu ka m'buworo n'iru Gi. 23 Ma mu onwem nọ n'aka-Gi mb͕e nile: I jidewo aka-nrim. 24 I gēji ndum-ọdu-Gi nēdum, Emesia I gēji kwa nsọpuru naram. 25 Ọ̀nye k m'nwere n'elu-igwe ma-ọbughi Gi? Ma-ọbughi Gi ọ dighi onye ihe-ya tọworom utọ n'uwa. 26 Anu-arum na obim agwusiwo: Oké nkume nke obim na òkèm ka Chineke bu rue mb͕e ebighi-ebi. 27 N'ihi na, le, ndi nọ gi n'ebe di anya gāla n'iyì: I kpochapuwo onye ọ bula nke nāpu n'aka-Gi akwa iko. 28 Ma mu onwem, ibiaru Chineke nso dim nma: Edowom ebe-nb͕abàm n'Onye-nwe-ayi, bú Jehova, Ka m'we kọ akukọ bayere ije-ozi-Gi nile.

Abù Ọma 74

1 Chineke, n'ìhi gini ka I juworo ayi aju rue mb͕e ebighi-ebi? N'ìhi gini ka iwe Gi nākwu anwuru imegide ìgwè aturu nke ọzùzù-anu-Gi? 2 Cheta nzukọ-Gi, nke I nwetaworo na mb͕e ochie, Nke I b͕aputaworo ibu ebo nke ihe-nketa-Gi; Cheta ugwu Zaion, ebe I biworo. 3 Zọlie ije ngwa ngwa ibiaru ebe nile etikpọrọ ebighi-ebi; Onye-iro emewo ihe ọjọ nile n'ebe nsọ. 4 Ndi nākpab͕u Gi ab͕ọwo uja n'etiti ebe-nzute-Gi; Ha edowo ihe-iriba-ama nile ha ibu ihe-iriba-ama, 5 Amara ha dika onye nēbuli anyu-ike elu nke-ukuN'alùghi-ulù nke osisi. 6 Ma ub͕u a ihe-ya nile nke eb͕uru eb͕ub͕u, Ha nēwere anyu-ike ntà na otùtù di iche iche tipia ya n'otù. 7 Ha esuwo ebe nsọ Gi ọku; Ọbuná rue ala ka ha meworo ebe-obibi aha-Gi ka ọ ghara idi nsọ. 8 Ha siri n'obi-ha, Ka ayi me ha ihe-ike n'otù: Ha esurewo ebe-nzute nile nke Chineke n'ala. 9 Ayi ahughi ihe-iriba-ama nile ayi: Ọ dighi onye-amuma di ọzọ; Ọ dighi kwa onye nọ n'etiti ayi nke mara mb͕e mb͕e gēru. 10 Chineke, rùe ole mb͕e ka onye-nkpab͕u gāta uta? Onye-iro, ò gēlelì aha-Gi anya rue mb͕e ebighi-ebi? 11 N'ìhi gini ka I nēseghachi aka-Gi, bú aka-nri-Gi? Seputa ya n'obi-Gi me ka ha gwusia. 12 Ma Chineke bu Ezem site na mb͕e ochie, Nke nālu ọlu nzọputa n'etiti uwa 13 Gi onwe-gi were ike-Gi tiwa oké osimiri: I tipiara isi nile nke ogologo anu-miri n'elu miri. 14 Gi onwe-gi tipiasiri isi nile nke oké agu-iyi, I nēnye ya enye iburu otù ndi ihe-oriri, bú ndi bi n'ala kpọrọ nku. 15 Gi onwe-gi kewara isi-iyi na miri-iyi: Gi onwe-gi mere ka osimiri nile nke nērù erù mb͕e nile takọrọ. 16 Gi nwe ehihie, ọzọ kwa, Gi nwe abali: Gi onwe-gi edoziwo ihe nēnye ìhè na anyanwu. 17 Gi onwe-gi emewo ka ókè-ala nile nke uwa guzo ọtọ: Mb͕e okpom-ọku na mb͕e oyi, Gi onwe-gi akpuwo ha. 18 Cheta nka, na onye-iro atawo Jehova uta, Cheta kwa na otù ndi di nsọkwu eleliwo aha-Gi. 19 Enyela anu-ọhia nkpuru-obi nke ndi gi: Echezọla ndu nke ndi-Gi ewedara n'ala rue mb͕e ebighi-ebi. 20 Legide ọb͕ub͕a-ndu-Gi: N'ihi na ebe nile nke b͕ara ọchichiri nke uwa juputara n'ebe-obibi nile nke ihe-ike. 21 Ekwela ka onye anāzọpia azọpia lata n'ihere: Me ka onye ewedara n'ala na ob͕eye to aha-Gi. 22 Bilie, Chineke, kpe ọnu-Gi n'ikpe: Cheta uta anāta Gi site n'ọnu onye-nsọkwu ogologo ubọchi nile. 23 Echezọla olu ndi nākpab͕u Gi: Nkpọtu nke ndi nēbili imegide Gi nāla elu mb͕e nile.

Abù Ọma 75

1 Ayi ekelewo Gi, Chineke; Ayi ekelewo ekele, aha-Gi di kwa nso: Ha akọwọ akukọ bayere oké ọlu-Gi nile. 2 Mb͕e m'gānara mb͕e akara àkà, Mu onwem gēkpe ikpe ziri ezi. 3 Ndi gbazeworo agbaze ka uwa na ndi nile ndi bi nime ya bu: Mu onwem atùwo ogidi nile ya. Selah 4 Asirim ndi nānya isi, Unu anyala isi: Asi-kwa-ram ndi nēmebi iwu, Unu ebulila mpi elu: 5 Unu ebulila mpi-unu rue ebe di elu; Unu ejila olu kwesiri ike kwue oké okwu. 6 N'ihi na ọ bughi n'Ọwuwa-anyanwu, ma-ọbu n'Ọdida-anyanwu, Ọ bughi kwa n'ọzara, ka nbuli-elu nēsi bia. 7 Kama Chineke bu onye-ikpe: Ọ nēme otù onye ka ọ di ala, Ọ nēbuli kwa onye ọzọ elu. 8 N'ihi na iko di n'aka Jehova, manya-vine nke di nime ya asuwo ufufu; O juputara na manya ejiri ihe gwa, O we si na nke ahu b͕aputa manya: N'ezie ọru-ala-ya nile, ndi nile n'uwa ndi nēmebi iwu gāzaputa ya ṅua. 9 Ma mu onwem, m'gēgosi oké ọlu-Gi rue mb͕e ebighi-ebi, M'gābùku Chineke nke Jekob abù ọma. 10 Ọzọ, mpi nile nke ndi nēmebi iwu ka m'gēbipu; Ma agēbuli mpi nile nke onye ezi omume.

Abù Ọma 76

1 Onye amaworo na Juda ka Chineke bu: N'Israel ka aha-Ya di uku. 2 Ọ bu kwa na Selem ka ulo-ntu-Ya di Ebe-obibi-Ya di kwa na Zaion. 3 N'ebe ahu ka Ọ b͕ajiri àkú nile nēb͕u àmùmà nke uta; Na ọta, na mma āgha, na agha. Selah 4 Onye juputara n'ihè ka I bu, I di ebube, nēsite n'ugwu nile nke anu adọb͕uru. 5 Akwatawo ihe ndi nwere obi ike n'agha, ha atuwo òrù-ura-ha; Ha achọtaghi kwa aka-ha, bú ndi nile bu dìnkpà. 6 Site n'ibasi-nba-ike nke Gi, Chineke nke Jekob, Ma ub͕ọ-ala ma inyinya adawo n'oké ura. 7 Gi onwe-gi, Onye anātu egwu ka I bu: Ọzọ, ònye gēguzo n'iru Gi site na mb͕e I were iwe? 8 I siri n'elu-igwe me ka anuru okwu ikpé; Uwa turu egwu, we di jū, 9 Mb͕e Chineke biliri ikpe ikpe, Izọputa ndi nile di ume-ala n'obi nke uwa. Selah 10 N'ihi na ọnuma madu gēkele Gi: I gēji ọnuma nile nke fọduru ke n'úkwù. 11 Kwenu nkwa, kwughachi kwa Jehova, bú Chineke-unu: Ka ndi nile ndi nọ Ya buruburu bukue onye ahu di egwu abu. 12 Ọ nēb͕ochi mọ ndi-ndú: Ọ bu onye anātu egwu n'ebe ndi-eze uwa nọ.

Abù Ọma 77

1 Olum ka m'nēji etiku Chineke, m'gēti kwa nkpu; Olum ka m'nēji etiku Chineke, Ọ gāṅakwam nti. 2 N'ubọchi nkpab͕um Onye-nwe-ayi ka m'chọrọ: Akam setiri eseti n'abali, o sinwukwaghi; Nkpuru-obim juru ka akasie ya. 3 M'gēcheta Chineke, su kwa ude nke-uku: M'gātughari uchem, ọzọ, mọm adighi-enwe ike. Selah 4 I jidere ndi-nche nke anyam abua: Ọ b͕aram ghari, m'we ghara ikwu okwu. 5 Echèrem èchìchè bayere ubọchi nile nke mb͕e ochie, Bú arọ nke mb͕e nile ebighi-ebi gara aga, si, 6 M'gēcheta abù m'nābù n'ikpọ ubọ-akwara n'abali: M'gēso obim tughari uche; Mọm we chọsie ike, si, 7 Ọ̀ bu rue mb͕e nile ebighi-ebi ka Onye-nwe-ayi gāju aju? Ọ̀ bu na ihem agaghi-atọ kwa Ya utọ ọzọ? 8 Ọ̀ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya gwuchapuworo? Ọ̀ gwusiwo, bú okwu-Ya, rue ọb͕ọ nile? 9 Ọ̀ chezọwo ime amara, bú Chineke? Ò kpuchitawo obi-ebere-Ya nile n'iwe? Selah 10 M'we si, Ọriam ka nka bu; Ma m'gēcheta arọ nile nke aka-nri nke Onye kachasi ihe nile elu. 11 M'gēhota omume nile nke Ja; N'ihi na m'gēcheta oké ọlu-Gi nile site na mb͕e ochie. 12 M'gātughari kwa uche n'ọlu-Gi nile, Ọ bu kwa n'omume-Gi nile ka m'gātughari obi. 13 Chineke, n'idi-nsọ ka uzọ-Gi di: Ònye bu chi uku dika Chineke? 14 Gi onwe-gi bu Chineke Nke nālu oké ọlu: I mewo ka amara ike-Gi n'etiti ndi nile di iche iche. 15 I jiwo ogwe-aka-gi b͕aputa ndi-Gi, Bú umu Jekob na Josef. Selah 16 Miri huru Gi, Chineke; Miri huru Gi, o nēb͕u ha nb͕u: Ọzọ, ob͕u-miri nile mara jijiji. 17 Igwe-oji nile wupuru miri; Mbara-ígwé mere ka olu-ha da udà: Ọzọ, àkú-gi nile nēfeghari. 18 Olu nke éb͕è-elu-igwe-Gi di n'ifufe nēfeghari buruburu; Àmùmà nyere elu-uwa dum madu bi ìhè: Ala mere nkpatu ma kwa jijiji. 19 N'oké osimiri ka uzọ-Gi di, Uzọ-ije-Gi nile di kwa n'ọtutu miri, Amaghi kwa nzọ-ukwu-Gi nile. 20 I duru ndi-Gi dika ìgwè ewu na aturu, Site n'aka Moses na Eron.

Abù Ọma 78

1 Ndim, ǹanu nti n'iwum: Tọnu nti n'ala inu okwu nile nke ọnum. 2 M'gāsaghe ọnum n'itu ilu: M'gēkwuwa okwu-omimi di iche iche n'uba, bú nke sitere na mb͕e ochie: 3 Nke ayi nuworo mara kwa, Nke nna-ayi-hà kọwo-kwa-ra ayi. 4 Ayi agaghi-ezonari ha na nti umu-ha, Nākọrọ ọb͕ọ nke gādi n'iru akukọ otuto nile nke Jehova, Na ike-Ya, na oké ọlu-Ya nile nke Ọ luworo. 5 O we me ka otù ihe-àmà guzosie ike nime Jekob, O do-kwa-ra iwu n'Israel, Nke O nyere nna-ayi-hà n'iwu, Ime ka umu-ha mara ha: 6 Ka ọb͕ọ nke gādi n'iru we mara, bú umu agāmu; Ha gēbili, we kọro umu-ha akukọ ahu: 7 Ka ha we tukwasi obi-ha na Chineke, Ghara ichezọ omume nile nke Chineke, Ma debe ihe nile O nyere n'iwu: 8 Ghara kwa idi ka ndi bu nna-ha, Ndi bu ọb͕ọ nēwezuga onwe-ha nke nānupu kwa isi; Ọb͕ọ ndi nēdozighi obi-ha, Ndi mọ-ha nēkwesighi ntukwasi-obi n'ebe Chineke nọ. 9 Umu Efraim, ọ bu ezie na ha nāchi ihe-agha nēbuli kwa uta, Ma ha chighariri n'ubọchi agha. 10 Ha edebeghi ọb͕ub͕a-ndu Chineke, Ma ha juru ijeghari n'iwu-Ya; 11 Ha we chezọ omume-Ya nile, Na oké ọlu-Ya nile nke O mere ka ha hu. 12 N'iru ndi bu nna-ha ka Ọ luru oké ọlu, N'ala Ijipt, n'ọhia Zoan. 13 O kewara oké osimiri, we me ka ha gabiga; O me-kwa-ra ka miri guzo ọtọ dika obo-ihe. 14 O ji-kwa-ra igwe-oji edu ha n'ehihie, Ji kwa ìhè ọku edu ha ogologo abali nile. 15 Ọ nākpọwa oké nkume di iche iche n'ọzara, We me ka ha ṅua miri ri nne dika o si nime ob͕u-miri puta. 16 O me-kwa-ra ka miri nke nērù erù si na nkume di elu puta, O we me ka miri nērùda dika ọtutu osimiri. 17 Ma ha nọ nēmehie kwa ọzọ imegide Ya, Inupu isi n'okpuru Onye kachasi ihe nile elu n'ala kpọro nku. 18 Ha we nwa Chineke n'obi-haN'iriọ ihe-oriri nye ọchichọ-nkpuru-obi-ha. 19 Ha we kwue okwu megide Chineke; Ha siri, Chineke, Ọ̀ puru ido table n'usoro n'ọzara? 20 Le, O tiri oké nkume ihe, miri we nērù erù, Isi-iyi di iche iche nērubiga kwa ókè; Ọ̀ di kwa achicha Ọ puru inye? Ọ̀ gēdoziri ndi-Ya anu? 21 N'ihi nke Jehova nuru, O we webiga iwe ókè: Ewe kponwue ọku megide Jekob, Ọzọ kwa, iwe kwugoro elu dika anwuru-ọku imegide Israel; 22 N'ihi na ha ekweghi na Chineke, Ha atukwasighi kwa obi-ha na nzọputa-Ya. 23 O we nye mbara-ígwé nile n'elu iwu, Meghe kwa ọnu-uzọ nile nke elu-igwe; 24 O we me ka manna zokwasi ha dika miri, ka ha rie, Ọ bu kwa ọka nke elu-igwe ka O nyere ha. 25 Nri nke ndi di ike ka madu riri: O zitere ha ihe ha gēriju afọ. 26 O nēme ka ifufe Iru-anyanwu bulie ije n'elu-igwe: O ji-kwa-ra ike-Ya duru ifufe Ndida. 27 O we me ka anu zokwasi ha dika ájá, Ọbuná dika ájá oké osimiri, bú anu-ufe nwere nkù: 28 O we me ka ọ da n'etiti ọmuma-ulo-ikwū-ha, Buruburu ebe-obibi-ha nile. 29 Ha we rie, afọ we ju ha nke-uku; Ọ bu kwa ihe ha nāchọsi ike ka Ọ nēme ka ọ biarue ha aru. 30 Ha abughi ndi ala ọzọ n'ebe ihe ha nāchọsi ike di, Ihe-oriri-ha nādi ha n'ọnu, 31 Mb͕e iwe Chineke kwugoro elu dika anwuru-ọku imegide ha, We b͕ue ufọdu n'etiti ndi-ha nke mara abuba, Ọ bu kwa umu-okorọbia nke Israel ka o mere ka ha ruru ala. 32 N'ihe a nile ha mehie-kwa-ara ọzọ, Ha ekweghi kwa n'oké ọlu-Ya nile. 33 O we me ka ubọchi nile ha gwusia n'otù nku-ume, O me-kwa-ra ka arọ nile ha gwusia n'obi-ọlulọ-miri. 34 Ọ buru na O b͕uru ha, ha we chọ Ya: Laghachi kwa, chọsie Chineke ike. 35 Ha we cheta na Chineke bu oké nkume-ha, Cheta kwa na Chineke Nke kachasi ihe nile elu bu Onye-nb͕aputa-ha. 36 Ha we ji ọnu-ha nārà Ya, Ji kwa ire-ha nāgwa Ya okwu-ugha. 37 Obi-ha eguzosighi kwa ike n'ebe Ọ nọ, Ha ekwesighi kwa ntukwasi-obi n'ọb͕ub͕a-ndu-Ya. 38 Ma Ya onwe-ya, ebe O nwere obi-ebere, Ọ nēkpuchi ajọ omume-ha, Ọ dighi-ebibi kwa ha: E, ọtutu mb͕e ka O mere iwe-Ya ka ọ laghachi azu, Ọ dighi-akpọte kwa ọnuma-Ya nile. 39 O we cheta na anu-aru ka ha bu; Ifufe nke nālafe alafe, we ghara ilaghachi. 40 Ùb͕ò ole ka ha nānupu isi n'okpuru Ya n'ọzara? Ùb͕ò ole ka ha nēme ka o wuta Ya n'ala tọb͕ọrọ n'efu? 41 Ha we chigharia, we nwa Chineke, Ọ bu kwa Onye nsọ nke Israel ka ha kpasuru iwe. 42 Ha echetaghi aka-Ya, Ubọchi mb͕e Ọ b͕aputara ha n'aka onye-nkpab͕u. 43 Otú O tiyere ihe-iriba-ama-Ya nile n'Ijipt, Tiye kwa ihe-ebube-Ya nile n'ọhia Zoan; 44 O we b͕anwe osimiri Nail nile ha ka ha ghọ ọbara, Ha adighi-aṅu kwa miri-ha nērù erù. 45 Ọ nēzite odudu n'etiti ha, nke nātab͕u ha; Ọ nēzite kwa awo, nke nēbibi ha. 46 Ọ nye-kwa-ra ọbubu ihe-omume-ha, Nye kwa igurube ihe ha dọb͕uru onwe-ha n'ọlu inweta. 47 O nēji ákú-miri-ígwé b͕u osisi vine nile ha, Ji kwa frost b͕u osisi sycomore nile ha. 48 O mechibido-kwa-ra anumanu-ha nye ákú-miri-ígwé, Mechibido kwa anu-ulo nile ha nye àmùmà di ọku. 49 Ọ nēzite ọnuma nke iwe-Ya n'etiti ha, Nrubiga-ókè-iwe, na iwe, na nkpab͕u, Bú ozìzì nke ndi-mọ-ozi nke ihe ọjọ. 50 Ọ nēme ka uzọ di lari bayere iwe-Ya; O b͕ochighi nkpuru-obi-ha n'inwu ọnwu, Kama O mechibidoro ndu-ha nye ajọ ọria nēfe efe; 51 O we tib͕ue nwa ọ bula eburu uzọ mu n'Ijipt, Bú nkpuru mbu nke ume-ha n'ulo-ikwū nile nke Ham: 52 O we me ka ndi-Ya bulie ije dika ìgwè ewu na aturu, Ọ nēdu kwa ha n'ozara dika ìgwè aturu. 53 O we nēdu ha n'ikwesi-ntukwasi-obi, ha atughi kwa oké egwu: Ma ndi-iro-ha, oké osimiri kpuchiri ha. 54 O we me ka ha biarue ókè-ala nsọ Ya, Rue ugwu a nke aka-nri-Ya nwetara. 55 Ọ chupu-kwa-ra mba nile n'iru ha, We me ka ala ha barue ndi ya aka n'ala nketa e ji údò tua, O we me ka ebo nile nke Israel biri n'ulo-ikwū-ha. 56 Ma ha nwara Chineke Nke kachasi ihe nile elu, ha we nupu isi n'okpuru Ya, Ha edebeghi kwa ihe-àmà-Ya nile; 57 Kama ha laghachiri azu, we ghọb͕ue nghọb͕u dika ndi bu nna-ha: Ha riri mpe dika uta nāghọ aghughọ. 58 Ha we were ebe nile ha di elu kpasue Ya iwe, Were kwa arusi nile ha apiri api me ka O kwo ekworo. 59 Chineke nuru nka, O we webiga iwe ókè, Jusie Israel ike: 60 O we rapu ebe-obibi nke Shailo, Bú ulo-ikwū nke O mere ka o biri n'etiti madu; 61 O we were ike-Ya nye ka adọta ya n'agha, Were kwa ima-nma-Ya nye n'aka onye-nkpab͕u. 62 O mechibido-kwa-ra ndi-Ya nye n'aka mma-agha; Ọ bu kwa ihe-nketa-Ya ka O webigara iwe-ókè megide. 63 Ọku ripiara umu-okorọbia-ha; Etoghi kwa umu-ab͕ọghọ-ha nāmaghi nwoke n'abù ọlulu-di. 64 Ndi-nchu-àjà-ha dara site na mma-agha; Ndinyom-ha di ha nwuru adighi-akwa kwa ákwá. 65 Onye-nwe-ayi we teta dika onye nāraru ura, Dika dike nke nēti nkpu nke-uku site na manya-vine. 66 O we tib͕ue ndi-nkpab͕u-Ya n'azu: Ita-uta ebighi-ebi ka O nyere ha. 67 Ọzọ, Ọ juru ulo-ikwū nke Josef, Ọ bughi kwa ebo Efraim ka Ọ rọputara; 68 Kama Ọ rọputara ebo Juda, Rọputa ugwu Zaion, nke Ọ huru n'anya. 69 O we wue ebe nsọ Ya dika ebe di elu, Dika uwa nke Ọ tọrọ ntọ-ala-ya rue mb͕e ebighi-ebi. 70 Ọ rọputa-kwa-ara Devid, bú orù-Ya, O we si n'ogige ìgwè ewu na aturu kuru ya: 71 O mere ka o si n'iso nne-aturu nke nēnye umu-ha ara bia, Izù Jekob, bú ndi-Ya, na Israel, bú ihe-nketa-Ya, dika aturu. 72 O we nāzù ha dika izu-okè nke obi-ya si di; Were kwa ihe-nghọta nile nke ọbu-aka-ya abua nēdu ha.

Abù Ọma 79

1 Chineke, mba di iche iche abatawo n'ihe-nketa-Gi; Ha emeruwo ulo uku Gi di nsọ; Ha emewo Jerusalem ka ọ ghọ ihe etikpọro etikpọ. 2 Ha ewerewo ozu ndi-orù-Gi nye iburu anu-ufe nke elu-igwe ihe-oriri, Were kwa anu-aru nke ndi-ebere-Gi nye anu-ọhia nile nke uwa. 3 Ha awusiwo ọbara-ha dika miri buruburu Jerusalem; Ọ dighi kwa onye ọ bula ṅēli ozu-ha. 4 Ayi aghọworo ndi-ab͕ata-obi-ayi ihe-ita-uta, Ghọ-kwa-ra ndi di ayi buruburu ihe-ichì-ọchì na ihe-ikwa-emò. 5 Rùe ole mb͕e, Jehova, ka I ganēwe iwe rue mb͕e ebighi-ebi? Ekworo-Gi, ọ̀ ganēre dika ọku? 6 Wukwasi mba nile ọnuma-Gi, bú ndi nāmaghi Gi, Wukwasi kwa ala-eze nile nke nākpọkughi aha-Gi. 7 N'ihi na ha eripiawo Jekob, Me kwa ka ebe-obibi-ya tọb͕ọrọ n'efu. 8 Echetala ajọ omume nile nke ndi-mbu-ayi imegide ayi: Kwe ka obi-ebere-Gi nile me ngwa izute ayi: N'ihi na ayi enweghi ike ma-ọli. 9 Yere ayi aka, Chineke nke nzọputa-ayi, n'ihi nsọpuru aha-Gi: Naputa kwa ayi, kpuchi kwa nmehie-ayi, n'ihi aha-Gi. 10 N'ìhi gini ka mba nile nāsi, Òle ebe Chineke-ha nọ? Ka amara ya n'etiti mba nile n'anya-ayi, Bú ibọ̀-ọ́bọ̀ ọbara nke ndi-orù-Gi nke awusiworo. 11 Kwe ka isu-ude nke onye-nkpọro bata n'iru Gi; Dika idi-uku nke ogwe-aka-Gi si di me ka ndi nāghaghi inwu anwu fọdu; 12 Gi nyeghachi kwa ndi-ab͕ata-obi-ayi ihe-ita-uta-ha nime obi-ha okpukpu asa, Bú nke ha jiri ta Gi uta, Onye-nwe-ayi. 13 Ayi onwe-ayi, bú ndi-Gi na ìgwè aturu nke ọzùzù-anu-gi, Gēkele Gi rue mb͕e ebighi-ebi; Ọb͕ọ nile ka ayi gākọrọ akukọ otuto-Gi.

Abù Ọma 80

1 Gi Onye nāzu Israel dika aturu, ṅa nti, Gi Onye nēdu Josef dika ìgwè ewu na aturu; Gi Onye bi n'etiti cherubim, nwuputa ka ìhè. 2 N'iru Efraim na Benjamin na Manase, kpọte idi-ike-Gi, Je izọputa ayi. 3 Chineke, me ka ayi lata; Me kwa ka iru-Gi mua, ewe zọputa ayi. 4 Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha, Rùe ole mb͕e ka iwe-gi gākwu anwuru imegide ekpere ndi-Gi? 5 I mewo ka ha rie nri nke bu anya-miri, I mewo kwa ka ha ṅua anya-miri nke juru ihe-ọtùtù uku. 6 I nēme ayi ka ayi ghọro ndi-ab͕ata-obi-ayi ihe-ilu-ọ̀gù: Ndi-iro-ayi nāchì kwa ọchì n'etiti onwe-ha. 7 Chineke nke usu nile nke ndi-agha, me ka ayi lata; Me kwa ka iru-Gi mua, ewe zọputa ayi. 8 I si n'Ijipt ropu osisi vine: I nāchupu mba di iche iche, we kua ya. 9 I doziri ọnọdu n'iru ya, O we b͕amie nkpọrọgwu, we juputa ala ahu. 10 Ejiri ǹdò-ya kpuchie ugwu nile, Ngalaba-ya di kwa ka osisi cedar nke Chineke. 11 Ọ nāwasa alaka-ya rue oké osimiri, Wasa kwa ome-ya rue Osimiri. 12 N'ìhi gini ka I tiwaworo ogige-ya nile, Ndi nile nke nāgabiga n'uzọ we ghọrọ nkpuru-ya? 13 Ezì nke si n'oké ọhia puta nātakwosi ya, Anu nke nēnughari n'ọhia nēwere kwa ya izù onwe-ya. 14 Chineke nke usu nile nke ndi-agha, biko, laghachikute ayi: Si n'elu-igwe legide anya, hu, leta kwa osisi vine a, 15 Na ogwe-osisi nke aka-nri-Gi kuworo, Lekwasi kwa ngalaba nke I mere ka o nwere Gi ume. 16 Esurewo ya n'oku, eb͕utuwo ya: Site n'ibasi-nba-ike nke iru-Gi ha nāla n'iyì. 17 Ka aka-Gi di n'aru nwoke nke aka-nri-Gi, N'aru nwa nke madu onye I mere ka o nwere Gi ume. 18 Ayi agaghi-esi kwa n'ebe I nọ laghachi azu: Me ka ayi di ndu, ọ bu kwa aha-Gi ka ayi gākpọku. 19 Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, me ka ayi lata; Me ka iru-gi mua, ewe zọputa ayi.

Abù Ọma 81

1 Tikuenu Chineke, bú ike-ayi, nkpu ọṅụ: Tikusienu Chineke nke Jekob nkpu ọṅụ ike. 2 Bulienu abù ọma, weta kwa egwú-otiti, Na ubọ-akwara di utọ, ya na une. 3 Fùanu opì-ike n'ọnwa ọhu, N'ọnwa ndọzu, n'ubọchi ememe-ayi. 4 N'ihi na ukpuru enyere Israel ka ọ bu, Ọ bu ikpe Chineke nke Jekob kpere. 5 Ihe-àmà nime Josef ka O doro ya, Mb͕e Ọ putara imegide ala Ijipt: Ọ bu okwu-ọnu nke otù onye m'nāmaghi ka m'nānu. 6 Ewezugaram ubu-ya n'ibu: Ọbu-aka-ya abua nēsi n'abọ gabiga. 7 Na nkpab͕u i kpọkurum, M'we naputa gi; Anamaza gi n'ebe-nzuzo nke éb͕è-elu-igwe; Anamanwa gi n'akuku miri Meriba. Selah 8 Nuru, ndim, M'gāb͕a àmà megide gi: Israel, ọ gādim nọ̄ nma ma ọ buru na i gēgem nti! 9 Ọ dighi chi ala ọzọ gādi nime gi; I gaghi-akpọ kwa isi ala nye chi mba ọzọ. 10 Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi, Nke nēme ka i si n'ala Ijipt rigoputa: Meghe ọnu-gi ka ọ sa mbara, M'gēmeju kwa ya. 11 Ma ndim egeghi nti olum; Israel ekweghikwam. 12 M'we zilaga ha n'isi-ike nke obi-ha, Ka ha we nējeghari na ndum-ọdu nile ha. 13 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ndim ganēgem nti, Ma asi na Israel gēje ije n'uzọm nile! 14 Nwa mb͕e ka M'gēji me ka ndi-iro-ha ruru ala, Ọ bu kwa imegide ndi nākpab͕u ha ka M'gēchighari akam. 15 Ndi nākpọ Jehova asi gērube isi aghughọ n'okpuru Ya: Ma mb͕e-ha gādiru mb͕e ebighi-ebi. 16 Ọ gēme kwa ka ha rie abuba ọka wheat: Ọ bu kwa manu-aṅu nke sitere n'oké nkume ka M'gēji nyeju gi afọ.

Abù Ọma 82

1 Chineke nēguzo Onwe-ya nime nzukọ Chineke; N'etiti chi nile ka Ọ nēkpe ikpe. 2 Rùe ole mb͕e ka unu gēkpe ikpe ajọ omume? Rù kwa ole mb͕e ka unu gāhu ndi nēmebi iwu iru-ọma? 3 Kpenu onye nēnweghi ike na nwa-nb͕ei ikpe ziri ezi: Guanu onye ewedara n'ala na onye nọ na nkpà n'onye ezi omume. 4 Menu ka onye nēnweghi ike na ob͕eye b͕apu: Naputanu ha n'aka ndi nēmebi iwu. 5 Ha amaghi, ha aghọtaghi kwa; N'ọchichiri ka ha nējeghari: Ewezugawo ntọ-ala nile nke uwa n'ọnọdu-ha. 6 Mu onwem siri, Chi ka unu bu, Ọ bu kwa umu nke Onye kachasi ihe nile elu ka unu bu. 7 Otú ọ di, dika madu ka unu gānwu, Ọ bu kwa dika otù nime ndi-isi ka unu gādà. 8 Bilie, Chineke, kpe uwa ikpe: N'ihi na Gi onwe-gi gēketa ihe, bú mba nile.

Abù Ọma 83

1 Chineke, edebela ọnu-Gi du: Ab͕ala nkiti, anọ-kwa-la jū, Chineke. 2 N'ihi na, le, ndi-iro-Gi nāb͕a aghara: Ọzọ, ndi nākpọ Gi asì ebuliwo isi-ha. 3 Ọ bu imegide ndi-Gi ka ha nāb͕a ìzù aghughọ, Ha nāb͕a ìzù imegide ndi-Gi edebeworo na nzuzo. 4 Ha asiwo, Jenu, ka ayi zopu ha n'ibu mbe; Agaghi-echeta kwa aha Israel ọzọ. 5 N'ihi na ha ewerewo otù obi b͕arita ìzù; Ọ bu imegide Gi ka ha nāb͕a ndu: 6 Ulo-ikwū nile nke Edom na ndi Ishmael; Moab na ndi Haga; 7 Gebal, na Amon, na Amalek; Filistia, ya na ndi bi na Taia: 8 Asiria araparawo kwa n'aru ha; Ha aghọworo umu Lot ogwe aka. Selah 9 Me ha otú I mere Midian; Otú I mere Sisera, otú I mere Jebin nime miri-iyi Kaishon: 10 Ekpochapuru ha n'En-doa; Ha ghọro ǹsí eji mezi ala. 11 Me ndi-ha amara aha-ha ka ha di ka Oreb, na dika Zeeb; Me kwa ka ndi-isi-ha nile di ka Zeba na dika Zalmuna: 12 Ndi siri, Ka ayi nwetara onwe-ayiEbe-obibi nile nke Chineke. 13 Chinekem, me ka ha di ka ihe nke ifufe nēfeghari buruburu, Dika ahihia n'iru ifufe. 14 Dika ọku nke nēré oke ọhia, Na dika ire-ọku nke nēme ka ugwu nile nwuru ọku; 15 Otú a were oké ifufe-Gi chua ha, Were kwa oké ikuku-Gi me ka ha ma jijiji. 16 Me ka nlelì che ha iru; Ka ha we chọ aha-Gi, Jehova. 17 Ka ihere me ha, ka ha ma kwa jijiji rue mb͕e ebighi-ebi; E, ka ha nwe iru-ihere, la n'iyì: 18 Ka ha we mara na Gi onwe-gi, Onye aha-Gi bu Jehova, nání Gi, Bu Onye kachasi ihe nile elu n'elu uwa nile.

Abù Ọma 84

1 Le ka ebe-obibi-Gi nile si buru eba ahuru n'anya nke-uku, Jehova nke usu nile nke ndi-agha! 2 Agu agusiwo nkpuru-obim ike, e, ọ gwusiwo kwa n'ichọ ogige nile nke Jehova; Obim na anu-arum nētiku Chineke di ndu nkpu ọṅù. 3 Ọbuná nnunu di ntà achọtawo ulo, Eléké achọtawo-kwa-ra onwe-ya akwu, ebe o tiyeworo umu-yaBú ebe-ichu-àjà-Gi nile, Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Ezem na Chinekem. 4 Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi bi n'ulo-Gi bu: Ha gānọ nēto Gi. Selah 5 Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu nke ike o nwere di na Gi; Uzọ nile atuliri atuli ijeru Zaion di ha n'obi. 6 Mb͕e ha nāgabiga ndagwurugwu Baka ha nēme ya ka ọ buru ebe isi-iyi di iche iche; Ọzọ, miri-ozuzo mbu nēwere ngọzi nile kpuchie ya. 7 Ha nēsi n'ike jerue ike, Anēme ka Chineke hu onye ọ bula nime ha nime Zaion. 8 Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha, nu ekperem: Ṅa nti, Gi Chineke nke Jekob. Selah 9 Le ọta-ayi, Chineke, Legide kwa iru onye-Gi etere manu. 10 N'ihi na otù ubọchi n'ogige-Gi nile di nma kari nnù ubọchi abua na ọgu iri n'ebe ọzọ. Arọputawom iguzo na nbata-uzọ n'ulo Chinekem, Kari ibi n'ulo-ikwū nile nke nmebi-iwu. 11 N'ihi na anyanwu na ọta ka Jehova, bú Chineke, bu: Amara na nsọpuru ka Jehova gēnye: Ọ gaghi-eb͕ochi ezi ihe n'ebe ndi nējeghari n'izu-okè nọ. 12 Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu nke nātukwasi obi na Gi.

Abù Ọma 85

1 Jehova, ihe ala-Gi atọwo Gi utọ: I mewo ndi Jekob adọtara n'agha ka ha lata. 2 I bupuwo ajọ omume ndi-Gi, I kpuchiwo nmehie-ha nile. Selah 3 I kpochapuwo nrubiga-ókè nke iwe-Gi: I siwo n'di-ọku nke iwe-Gi chighari Onwe-gi. 4 Me ka ayi lata, Chineke nke nzọputa-ayi, Me ka ọ gwusia, bú iwe ayi nākpasu Gi. 5 Ọ̀ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka I ganēwesa ayi iwe? Ì gēme ka iwe-Gi digide rue ọb͕ọ nile? 6 Gì onwe-gi agaghi-eme ka ayi di kwa ndu ọzọ: Ka ndi-Gi we ṅuria nime Gi? 7 Jehova, me ka ayi hu ebere-Gi, Nye kwa ayi nzọputa-Gi. 8 M'gānu ihe Chineke, bú Jehova, gēkwu: N'ihi na Ọ gāgwa ndi-Ya, gwa kwa ndi-ebere-Ya, okwu udo: Ma ka ha ghara ilaghachi ba n'ihe-nzuzu. 9 Otú ọ di, nzọputa-Ya di nso ndi nātu egwu Ya; Ka nsọpuru we biri n'ala-ayi. 10 Ebere na ezi-okwu ezutewo; Ezi omume na udo esutuwo ọnu. 11 Ezi-okwu nēpú epú n'ala; Ezi omume esiwo kwa n'elu-igwe lepu anya. 12 Ọzọ, Jehova gēnye ezi ihe; Ala-ayi gēnye kwa ihe-ọmume-ya. 13 Ezi omume gāga n'iru Ya; Ọ gēme kwa ka nzọ-ukwu-Ya nile ghọ uzọ.

Abù Ọma 86

1 Jehova, tọ nti-Gi n'ala, zam; N'ihi na onye ewedara n'ala na ob͕eye ka m'bu. 2 Debe nkpuru-obim; n'ihi na onye-ebere ka m'bu: Gi onwe-gi Chinekem, zọputa orù-Gi nke nātukwasi obi na Gi. 3 Merem amara, Onye-nwe-ayi; N'ihi na Gi ka m'nākpọku ogologo ubọchi nile. 4 Me ka nkpuru-obi orù-Gi ṅuria; N'ihi na ọ bu Gi, Onye-nwe-ayi, ka m'nēbuli nkpuru-obim nye. 5 N'ihi na Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi, di nma, I bu kwa onye nāb͕aghara nmehie, I nāba kwa uba n'ebere n'aru ndì nile nākpọku Gi. 6 Jehova, ge nti n'ekperem; Ṅa kwa nti n'olu arirọ-amaram nile. 7 N'ubọchi nkpàm m'gākpọku Gi; N'ihi na I gāzam. 8 Ọ dighi onye di ka Gi n'etiti chi nile, Onye-nwe-ayi; Ọ dighi kwa ọlu di ka ọlu-Gi nile. 9 Mba nile ndi I meworo gābia kpọ isí ala n'iru Gi, Onye-nwe-ayi; Ha gāsọpuru kwa aha-Gi. 10 N'ihi na onye uku ka I bu, I nālu kwa oké ọlu di iche iche: Gi onwe-gi bu Chineke, nání Gi. 11 Zim uzọ-Gi Jehova; m'gējeghari n'ezi-okwu-Gi: Me ka obim di n'otù itu egwu aha-Gi. 12 M'gēji obim nile kele Gi, Onye-nwe-ayi, Chineke; M'gāsọpuru kwa aha-Gi rue mb͕e ebighi-ebi. 13 N'ihi na ebere-Gi di uku n'arum; I siwo n'ala-mọ nke dichasi ala naputa nkpuru-obim. 14 Chineke, ndi-nganga ebiliwo imegidem, Nzukọ ndi nēme ka madu ma jijiji achọwo kwa nkpuru-obim, Ha edoghi kwa Gi n'iru ha. 15 Ma Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi, bu Chineke Nke nwere obi-ebere, Onye di kwa amara, Nke nādighi-ewe iwe ọsọsọ, Nke nāba kwa uba n'ebere na ezi-okwu. 16 Chem iru, me-kwa-ram amaraNye orù-Gi ike-Gi, Zọputa kwa nwa-nwoke nke orù-Gi nwayi. 17 Merem ihe-iriba-ama bayere ezi ihe I gēmerem; Ka ndi nākpọm asì we hu ya, ka ihere we me ha, N'ihi na Gi onwe-gi, Jehova, eyeworom aka, kasikwam obi.

Abù Ọma 87

1 Ntọ-ala-Ya di n'ugwu nsọ nile. 2 Jehova nāhu ọnu-uzọ-ama nile nke ZaionKari ebe-obibi nile nke Jekob. 3 Ihe di iche iche nke di nsọpuru ka anēkwu bayere gi, Obodo Chineke. Selah 4 M'gēhota Rehab na Babilon, na ha di n'etiti ndi maram: Le Filistia na Taia, ha na Etiopia; Nka ka amuru n'ebe ahu. 5 Ọ bu kwa Zaion ka agēkwu okwu bayere ya, si, Onye na onye ọ bula ka amuru nime ya; Ọzọ, Ya onwe-ya, bú Onye kachasi ihe nile elu, gēme ka o guzosie ike. 6 Jehova gāgu, mb͕e O ji de ndi nile di iche iche n'akwukwọ, si, Nka ka amuru n'ebe ahu. Selah 7 Ma ndi nābù abù ma ndi nēte egwú, ha nile gāsi, Isi-iyim nile di na Gi.

Abù Ọma 88

1 Jehova, Chineke nke nzọputam, N'ehihie ka m'tiworo nkpu, n'abali kwa, n'iru Gi: 2 Kwe ka ekperem bata n'iru Gi; Tọ nti-Gi n'ala n'iti-nkpum: 3 N'ihi na afọ ihe ọjọ di iche iche ejuwo nkpuru-obim, Ndum abiaruwo kwa nso ala-mọ. 4 Aguwom na ndi nārida n'olùlù; Aghọwom onye di ka nwoke nēnweghi ike: 5 Anọm n'etiti ndi nwuru anwu, buru onye nwere onwe-ya, Dika ndi eb͕uru eb͕u ndi nēdina n'ílì, Ndi I nēchetaghi ọzọ; Ndi ahu bu kwa ndi ebipuworo n'aka-Gi. 6 I tọb͕ọwom n'olùlù dichasi ala, N'ebe di iche iche b͕ara ọchichiri, nime miri di omimi. 7 Ọnuma-Gi akwagidewom, I werewo kwa ebili-miri-Gi nile wedam n'ala. Selah 8 I mewo ka ndi m'mara nke-ọma nọm n'ebe di anya; I mewom ka m'ghọrọ ha ihe-árú: Abum onye eb͕ochiworo, adighm-apu kwa n'èzí. 9 Anyam adalawo n'isi site na nweda-n'ala: Jehova, akpọkuwom I kwa-ubọchi, Ab͕asawom ọbu-akam abua n'ebe I nọ. 10 Ọ̀ bu ndi nwuru anwu ka I gāluru oké ọlu? Ndi nādighi ndu, hà gēbili kele Gi? Selah 11 Àgākọ akukọ ebere-Gi n'ílì? Àgākọ akukọ ikwesi-ntukwasi-obi-Gi n'ebe-ila-n'iyì? 12 Àgāmara oké ọlu-Gi n'ọchichiri? Àgāma kwa ezi omume-Gi n'ala nchezọ-ihe? 13 Ma mu onwem, ọ bu Gi ka m'tikuworo, Jehova, Ọ bu kwa n'ututu ka ekperem gēje izute Gi. 14 Jehova, n'ìhi gini ka I nāju nkpuru-obim? N'ìhi gini ka I nēzonarim iru-Gi? 15 Onye ewedara n'ala na onye nēkubi ume ka m'bu site na nwata: Eburuwom oké ujọ Gi nile, obim nālọ miri. 16 Iwe-Gi di ọku agabigawo n'isim; Ihe-egwu-Gi nile ekpochapusiwom. 17 Ha dim buruburu dika miri ogologo ubọchi nile; Ha ab͕awom buruburu n'otù. 18 I mewo ka onye nāhum n'anya na eyìm nọm n'ebe di anya, Ndi m'mara nke-ọma ka ọchichiri bu.

Abù Ọma 89

1 Ebere nile nke jehova ka m'gābù abù-ha rue mb͕e ebighi-ebi: Ọb͕ọ nile ka m'gēwere ọnum me ka ha mara ikwesi-ntukwasi-obi-Gi. 2 N'ihi na asiwom, Rue mb͕e ebighi-ebi ka agēwuli ebere elu dika ulo; Elu-igwe, I gēme ka ikwesi-ntukwasi-obi-Gi guzosie ike nime ha. 3 Mu na onye M'rọputara ab͕awo ndu, Aṅuworom Devid, bú orùm, iyi; 4 Rue mb͕e ebighi-ebi ka M'gēme ka nkpuru-gi guzosie ike, M'gēwu kwa oche-eze-Gi rue ọb͕ọ nile. Selah 5 Elu-igwe gēkele kwa oké ọlu-Gi, Jehova; Kele kwa ikwesi-ntukwasi-obi-Gi nime nkpọkọta nke ndi nsọ. 6 N'ihi na ònye nime mbara-ígwé ka agēji turu Jehova? Ònye yiri Jehova n'etiti umu Chineke? 7 Ọ bu Chineke Nke anāmara jijiji ri nne n'ìzù nzuzo nke ndi nsọ, Ọ bu kwa Onye anātu egwu Ya kari ndi nile di Ya buruburu. 8 Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha, Ònye di ike dika Gi, Ja? Ikwesi-ntukwasi-obi-Gi di kwa Gi buruburu. 9 Gi onwe-gi nāchi nbili-elu nke oké osimiri: Mb͕e nmali-miri-ya nile nēbuli onwe-ha elu, Gi onwe-gi nēme ka ha dajua. 10 Gi onwe-gi azọpiawo Rehab, dika onye eb͕uru eb͕u; I werewo ogwe-aka nke ike-Gi chusa ndi-iro-Gi. 11 Gi nwe elu-igwe, Gi nwe kwa uwa: Elu-uwa dum madu bi na ùjú-ya, Gi onwe-gi atọwo ntọ-ala-ha. 12 Ugwu na Ndida, Gi onwe-gi ekèwo ha: Teboa na Heamon nēti nkpu ọṅù n'aha-gi. 13 Gi nwere ogwe-aka nke idi-ike di nime ya: Aka-Gi di ike, aka-nri-Gi di elu. 14 Ezi omume na ikpe ziri ezi bu ọnọdu guzosiri ike nke oche-eze-Gi: Ebere na ezi-okwu nāga n'iru Gi. 15 Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi ahu bu nke mara olu iti-nkpu ahu: Jehova, n'ìhè nke iru-Gi ka ha nēje ije. 16 N'aha-Gi ka ha nēteghari egwú ọṅù ogologo ubọchi nile: Ọ bu kwa n'ezi omume-Gi ka ha nādi elu. 17 N'ihi na ima-nma nke ike-ha ka I bu: Ọ bu kwa n'utọ ihe-ayi nātọ Gi ka mpi-ayi nādi elu. 18 N'ihi na Jehova nwe ọta-ayi; Ọ bu kwa Onye Nsọ nke Israel nwe eze-ayi. 19 Mb͕e ahu I gwara ndi-ebere-Gi okwu n'ọhù, Si, Atukwasiwom iye-aka n'aru dike; Emewom ka otù onye arọputaworo n'etiti ndim di elu. 20 Achọtawom Devid, bú orùm; Ewerewom manu nsọm te ya: 21 Onye akam gēguzosi ike n'ebe ọ nọ; Ọzọ, ogwe-akam gāb͕a ya ume. 22 Onye-iro agaghi-abiakwasi ya na mberede; Ọzọ, nwa nke ajọ omume agaghi-eweda ya n'ala. 23 M'gētipia kwa ndi nākpab͕u ya n'iru ya, Ti kwa ndi nākpọ ya asì ihe. 24 Ma ikwesi-ntukwasi-obim na eberem gādi n'aru ya: Ọ bu kwa n'aham ka mpi-ya gādi elu. 25 M'gēdo kwa aka-ya n'oké osimiri, Do kwa aka-nri-ya n'osimiri nile. 26 Onye ahu gākpọm, si, Nnam ka I bu, Chinekem, na oké nkume nke nzọputam. 27 Ọzọ, Mu onwem gēme ya ọkparam, Onye kachasi ihe nile elu n'ebe ndi-eze nke uwa nọ. 28 Rue mb͕e ebighi-ebi ka M'gēdebere ya eberem, Ọb͕ub͕a-ndum gēkwesi-kwa-ra ya ntukwasi-obi. 29 M'gēme kwa ka nkpuru-ya dirue mb͕e ebighi-ebi, Me kwa ka oche-eze-ya di ka ubọchi nile nke elu-igwe. 30 Ọ buru na umu-ya arapu iwum, Ghara kwa ijeghari n'ikpém nile; 31 Ọ buru na ha eme ka ukpurum nile ghara idi nsọ, Ọ buru kwa na ha edebeghi ihe nile M'nyere n'iwu; 32 M'gēwere kwa nkpa-n'aka leta njehie-ha, Were kwa ihe-otiti leta ajọ omume-ha. 33 Ma M'gaghi-esi n'ebe ọ nọ mebie eberem, M'gaghi-ekwu kwa okwu-ugha megide ikwesi-ntukwasi-obim. 34 M'gagh-eme ka ọb͕ub͕a-ndum ghara idi nsọ, Ọzọ, M'gagh-agbanwe ihe siworo n'eb͕ub͕ere-ọnum abua puta. 35 Otù ub͕ò ka M'jiworo idi-nsọm ṅua iyi; M'gaghi-agwa Devid okwu-ugha ma-ọli; 36 Nkpuru-ya gādiru mb͕e ebighi-ebi, Oche-eze-ya gādi kwa ka anyanwu n'irum. 37 Dika ọnwa ka o gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi; Ọzọ, Onye-àmà Nke nọ na mbara-ígwé kwesiri ntukwasi-obi. Selah 38 Ma Gi onwe-gi achipuwo, ju kwa aju. I wesabigawo onye-Gi etere manu iwe ókè. 39 I sọwo ọb͕ub͕a-ndu nke orù-Gi oyi: I mewo ka okpu-eze-ya ghara idi nsọ ọbuná rue ala. 40 I tiwawo ogige-ya nile; I mewo ka ebe-ya nile ewusiri ike buru ihe dapiara adapia. 41 Ndi nile nke nāgabiga n'uzọ apunarawo ya ihe: Ọ ghọworo ndi-ab͕ata-obi-ya ihe-ita-uta. 42 I mewo ka aka-nri nke ndi nākpab͕u ya di elu; I mewo ka ndi-iro-ya nile ṅuria. 43 Ọzọ, I nēme ka ọnu mma-agha-ya laghachi azu, I meghi kwa ka o guzosie ike n'agha. 44 I mewo ka onwunwu-ọcha-ya kwusi, I tudawo kwa oche-eze-ya rue ala. 45 I bilatawo ubọchi nile ọ bu okorọbia: I werewo ihere kpuchie ya n'aru. Selah 46 Jehova, rùe ole mb͕e ka I gēzobe onwe-gi ebighi-ebi? Rùe ole mb͕e ka ọnuma-Gi ganēre dika ọku? 47 Cheta otú mb͕e ndu mu onwem di nkpunkpu: Ọ̀ bu ihe-efu gini ka I kèworo umu madu nile nye? 48 Òle nwoke ọ bu nke gādi ndu, ghara ihu ọnwu anya, Nke gēme ka nkpuru-obi-ya wepuga onwe-ya n'aka ala-mọ? Selah 49 Òle ebe ebere, mbu Gi nile di. Onye-nwe-ayi, Nke I ṅuru Devid iyi bayere ha n'ikwesi-ntukwasi-obi-Gi? 50 Onye-nwe-ayi, cheta ita-uta ndi-orù-Gi; Eburuwom n'obim ita-uta nke ndi nile di iche iche bara uba; 51 Nke ndi-iro-Gi jiworo ta uta, Jehova, Nke ha jiworo ta nzọ-ukwu nile nke onye-Gi etere manu uta. 52 Onye agọziri agọzi ka Jehova bu rue mb͕e ebighi-ebi. Amen, na Amen.

AKWUKWỌ NKE-ANỌ

Abù Ọma 90

1 Onye-nwe-ayi, ebe-obibi ka Gi onwe-gi buworo ayiN'ọb͕ọ nile. 2 Tutu amuputa ugwu, Ma-ọbu tutu I kpua uwa na elu-uwa dum madu bi, Ọbuná site na mb͕e ebighi-ebi rue mb͕e ebighi-ebi, Gi onwe-gi bu Chineke. 3 I nēme ka madu laghachi n'ájá; I we si, Laghachinu, umu madu. 4 N'ihi na nnù arọ abua na ọgu iri n'anya-GiDi ka nnyahuru mb͕e ọ nāga, Na dika otù nche n'abali. 5 I wuchapuwo ha dika oké miri-ozuzo; nání ura ka ha bu: N'ututu ha di ka ahihia nētó etó. 6 N'ututu ọ nāb͕awa uzari, nētó kwa etó; N'anyasi ka anēbipu ya, o we kpọnwua. 7 N'ihi na emewo ka ayi gwusia n'iwe-Gi, Ọ bu kwa n'ọnuma-Gi ka emeworo ka ayi ma jijiji. 8 I dowo ajọ omume nile ayi n'iru Gi, I dowo nmehie-ayi zoro ezo n'ìhè nke iru-Gi. 9 N'ihi na ubọchi-ayi nile agawo nime nrubiga-ókè nke iwe-Gi: Ayi emewo ka arọ nile ayi gwusia dika otù nze-ume. 10 Ubọchi arọ nile ayi di ọgu arọ atọ na iri; Ma ọ buru na ha esite n'idi-ike-ayi rue ọgu arọ anọ, Otú ọ di, nganga-ha bu nání idọb͕u-onwe-ha-n'ọlu na ajọ ihe; N'ihi na ọ b͕apuwo ọsọsọ, ayi we fela dika nnunu. 11 Ònye mara ike nke iwe-Gi, Na nrubiga-ókè nke iwe-Gi dika egwu nke kwesiri Gi si di? 12 Si otú a me ka ayi mara iguta ubọchi-ayi, Ka ayi we me ka obi amam-ihe bia. 13 Lata, Jehova; rùe ole mb͕e? Chèghari kwa obi-Gi bayere ndi-orù-Gi. 14 Were ebere-Gi me ka afọ ju ayi n'ututu; Ka ayi we tie nkpu ọṅù, ṅuri kwa, ubọchi-ayi nile. 15 Me ka ayi ṅuria dika ubọchi nile si di I wedaworo ayi n'ala nime ha, Na dika arọ si di nke ayi huworo ihe ọjọ nime ha. 16 Kwe ka ndi-orù-Gi hu ọlu-Gi, Kwe kwa ka ahu ima-nma-Gi n'aru umu-ha. 17 Ka idi-utọ nke Onye-nwe-ayi, bú Chineke-ayi, dikwasi ayi: Gi me kwa ka ọlu aka-ayi guzosie ike n'aru ayi; E, ọlu aka-ayi, me ka o guzosie ike.

Abù Ọma 91

1 Onye nēbi n'ebe-nzuzo nke Onye kachasi ihe nile elu, Ọ bu n'okpuru ǹdò nke Onye puru ime ihe nile ka ọ nānọ ọnọdu-abali. 2 M'gāsi Jehova, I bu ebe-nb͕abàm na ebem ewusiri ike; I bu Chinekem, Onye m'nātukwasi obi. 3 N'ihi na Ya onye-ya gānaputa gi n'ib͕udu nke osi-ọnyà, Na n'aka ajọ ọria nēfe efe nke nēweta ila-n'iyì. 4 Nkù-Ya ka O gēji kpuchie gi, Ọ bu kwa n'okpuru nkù-Ya abua ka i gāb͕àba: Ọta uku na ọta di buruburu ka ezi-okwu-Ya bu. 5 I gaghi-atu egwu site n'oké egwu nke abali, Ma-ọbu site n'àkú nke nēfeghari n'ehihie; 6 Ma-ọbu site n'ajọ ọria nēfe efe nke nējeghari n'ọchichiri, Ma-ọbu site na nbipu nke nēbibi n'etiti-ehihie. 7 Nnù madu abua na ọgu iri gāda n'akuku-gi; Orú nnù madu na nnù ise gāda kwa n'aka-nri-gi; Ma ọ gaghi-abiaru gi nso. 8 Ọ bu nání na I gēji anya-gi abua legide, We hu nkwughachi nke ndi nēmebi iwu. 9 N'ihi na gi onwe-gi asiwo, Jehova bu ebe-nb͕abàm; N'ihi na ọ bu Onye kachasi ihe nile elu ka i meworo ebe-obibi-gi; 10 Ihe ọjọ agaghi-adakwasi gi, Ihe-otiti agaghi-abiaru kwa nso ulo-ikwū-gi. 11 N'ihi na ndi-mọ-ozi-Ya ka Ọ gēnye iwu bayere gi, Idebe gi n'uzọ-gi nile. 12 N'elu ọbu-aka-ha ka ha gēburu gi, Ka i ghara ikpọbì ukwu-gi na nkume. 13 Ọbuná ọdum na aju-ala ka i gāzọkwasi ukwu: I gāzọb͕u nwa-ọdum na ogologo anu-miri. 14 N'ihi na ọ huwom n'anya si-ike, M'gēme kwa ka ọ b͕aputa: M'gēme ka ọ nọ n'ebe di elu, n'ihi na ọ mawo aham. 15 Ọ gākpọkum, M'gāza kwa ya; Mu onwem gānọyere ya n'ahuhu: M'gādọputa ya, sọpuru kwa ya. 16 Ubọchi ndu di ogologo ka M'gēji me ka afọ ju ya, M'gēme kwa ka o lekwasi nzọputam anya.

Abù Ọma 92

1 Ọ bu ezi ihe ikele Jehova ekele, Na ibùku aha-Gi abù ọma, Gi Onye kachasi ihe nile elu: 2 Igosi ebere-Gi n'ututu, Igosi kwa ikwesi-ntukwasi-obi-Gi kwa-abali, 3 Nēji ubọ nke akwara iri, nēji kwa une; Nēji higgaion n'elu ubọ-akwara. 4 N'ihi na I mewo ka m'ṅuria site n'ọlu-Gi, Jehova: Ọ bu n'ọlu nile nke aka-Gi ka m'gēti nkpu ọṅù. 5 Le ka ọlu-Gi nile si di uku, Jehova! Èchìchè-Gi miri emi nke-uku. 6 Madu nke bu anu-ọhia adighi-ama ama; Onye-nzuzu adighi-aghọta kwa nka: 7 Mb͕e ndi nēmebi iwu nāma akwukwọ dika ihe-ọkukú, Mb͕e ndi nile nke nalu ajọ ihe nāwa kwa okoko-osisi; Ọ bu ka ewe kpochapu ha rue mb͕e nile ebighi-ebi: 8 Ma Gi onwe-gi nọ n'ebe di elu rue mb͕e ebighi-ebi, Jehova. 9 N'ihi na, le, ndi-iro-Gi, Jehova, N'ihi na, le, ndi-iro-Gi gāla n'iyì; Ndi nile nke nālu ajọ ihe gēkesa onwe-ha. 10 Ma I mewo ka mpim di elu dika mpi atu: Ejiwo manu ọhu wusam. 11 Anyam elekwasiwo kwa ndi nēchem anwu, Ihe bayere ndi nēbili imegidem, bú ndi nēme ihe ọjọ, ka ntim abua nānu. 12 Onye ezi omume gāwa igù dika nkwu: Dika osisi cedar nime Lebanon ka o gēbù ibù. 13 Ndi akuworo n'ulo Jehova dika osisiGāma akwukwọ n'ogige nile nke Chineke-ayi. 14 Ha gānọ nāmi nkpuru n'isi-awọ; Osisi nke miri di ha n'aru ri nne, nke nwezu-kwa-ra akwukwọ ndu, ka ha gābu. 15 Igosi na Jehova zirí ezi; Ọ bu oké nkumem, ọ dighi kwa ajọ omume di nime Ya.

Abù Ọma 93

1 Jehova bu eze; idi-elu ka O yiriworo dika uwe; Jehova eyiriwo uwe, O werewo ike ke Onwe-ya n'úkwù: Ọzọ, elu-uwa dum madu bi nēguzosi ike, adighi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya. 2 Oche-eze-Gi eguzosiwo ike site na mb͕e ochie: Site na mb͕e ebighi-ebi ka I nọ. 3 Osimiri eweliwo olu-ha, Jehova, Osimiri eweliwo olu-ha; Osimiri nēweli ebili-miri nile ha elu. 4 Kari olu nile nke ọtutu miri, Kari ebili-miri nile di ebube nke oké osimiri, Jehova Nke nọ n'ebe di elu di ebube. 5 Ihe-àmà-Gi nile kwesiri ntukwasi-obi nke-uku: N'ebe ulo-Gi di idi-nsọ mara nma, Jehova, rue ubọchi nile nke ndu di ogologo.

Abù Ọma 94

1 Chineke nke ọ́bọ̀ nile, Jehova, Chineke nke ọ́bọ̀ nile, nwuputa ìhè. 2 Bulie Onwe-gi, Onye-ikpe nke uwa: Nyeghachi ndi-npako nmeso-ha. 3 Jehova, rùe ole mb͕e ka ndi nēmebi iwu, Rùe ole mb͕e ka ndi nēmebi iwu gāṅuri ọṅu-agha? 4 Ha nēkwuwa okwu-ọnu, ha nēkwu oké okwu: Ndi nile nke nālu ajọ ihe nānya isi. 5 Ndi-Gi ka ha nāzọpia, Jehova, Ọ bu kwa ihe-nketa-Gi ka ha nēweda n'ala. 6 Ha nēb͕u nwanyi di-ya nwuru, na ọbìa, Ha nēb͕u kwa umu-nb͕ei n'ọchu. 7 Ha we si, Ja agaghi-ahu, Chineke nke Jekob agaghi-amata kwa. 8 Ghọtanu, unu ndi bu anu-ọhia n'etiti ndi Israel: Unu ndi-nzuzu kwa, òle mb͕e unu gēnwe uche? 9 Onye nāku nti dika ihe-ọkukú, Ọ̀ gaghi-anu íhe? Ma-ọbu Onye nākpu anya, Ọ̀ gaghi-ahuwa uzọ? 10 Onye nādọ mba nile aka na nti, Ọ̀ gaghi-aba nba, Bú Onye nēzí madu ihe-ọmuma? 11 Jehova mara èchìchè madu, Na èchìchè ahu bu nání otù nku-ume. 12 Onye ihe nāgara nke-ọma ka nwoke ahu bu nke I nādọ aka na nti, Ja, Onye I nēsi kwa n'iwu-Gi zí ihe; 13 Ime ka ọ nọ jū pua n'ubọchi nile nke ihe ọjọ, Rue mb͕e agēgwuru onye nēmebi iwu olùlù. 14 N'ihi na Jehova agaghi-ara ndi-Ya aka, Ọ gaghi-arapu kwa ihe-nketa-Ya. 15 N'ihi na ikpé gālaghachikute ezi omume: Ndi nile ndi ziri ezi n'obi gēso kwa ya. 16 Ònye gēbilirim imegide ndi nēme ihe ọjọ? Ònye gēme onwe-ya ka o guzosierem ike imegide ndi nālu ajọ ihe? 17 Ọ buru na Jehova abughi onye nēyerem aka, Ọ fọduru nwa mb͕e nkpuru-obim gēbiwori n'ebe inọ-dū. 18 Ọ buru na asiwom, Ewezugawo ukwum n'ọnọdu-ya; Ebere-Gi nākwagidem, Jehova. 19 Mb͕e ncheb͕um nāba uba n'imem, Nkasi-obi-Gi nile nāgugu nkpuru-obim. 20 Àgējikọta Gi na oche-eze nke ihe-ila-n'iyì nile, Nke nēji ukpuru kpuzí nmeb͕u? 21 Ha nēdo onwe-ha n'usu ndi nāpunara madu ihe imegide nkpuru-obi onye ezi omume, Ọ bu kwa ọbara nēmeghi ihe ọjọ ka ha nāma ikpe. 22 Ma Jehova aburuworom ulo-elu; Chinekem bu kwa oké nkume nke ebe-nb͕abàm. 23 O mewo kwa ka ajọ ihe-ha laghachikute ha, Ọ bu kwa ihe ọjọ ha ka Ọ gēji kpochapu ha; Jehova, bú Chineke-ayi, gēkpochapu ha.

Abù Ọma 95

1 Bianu, ka ayi tikue Jehova nkpu ọṅù: Ka ayi tikusie oké nkume nke nzọputa-ayi nkpu ọṅù ike. 2 Ka ayi were ekele bia n'iru Ya, Ka ayi were abù ọma tikusie Ya nkpu ọṅù ike. 3 N'ihi na Chineke uku ka Jehova bu, Ọ bu kwa Eze uku nāchi chi nile. 4 Onye ebe nile nke michasiri emi nke uwa di n'aka-Ya: Ebe dichasi elu nke ugwu nile bu kwa nke Ya. 5 Onye nwere oké osimiri, Ya onwe-ya me-kwa-ra ya; Ọ bu kwa aka-Ya kpuru ala-akọro. 6 Batanu, ka ayi kpọ isi ala ruru kwa ala; Ka ayi b͕ue ikperè n'ala n'iru Jehova Onye meworo ayi: 7 N'ihi na Ya onwe-ya bu Chineke-ayi: Ayi onwe-ayi bu kwa ndi Ọ nāzù dika aturu, buru kwa ìgwè aturu nke aka-Ya. Ta, ọ buru na unu ege nti olu-ya, 8 Unu emela ka obi-unu sie ike, dika na Meriba, Dika n'ubọchi Masa n'ọzara: 9 Mb͕e nna-unu-hà nwaram, Nwaputam ìhè, hu kwa ọlum. 10 Ọgu arọ abua ka M'nāsọ ọb͕ọ ahu oyi, M'we si, Ndi nke nākpafu n'obi-ha ka ha bu, Ha onwe-ha amaghi kwa uzọm nile: 11 N'ihi ya aṅurum iyi n'iwem, si, Ha agaghi-abà n'izu-ikem ma-ọli

Abù Ọma 96

1 Bùkuenu Jehova abù ọhu: Bùkuenu Jehova abù, unu uwa nile. 2 Bùkuenu Jehova abù, gọzienu aha-Ya; Nēzisanu ozi nzọputa-Ya site n'otù ubọchi rue ubọchi ọzọ. 3 Kọsanu akukọ ebube-Ya n'etiti mba nile, Akukọ oké ọlu-Ya nile n'etiti ndi nile di iche iche. 4 N'ihi na Jehova di uku, buru kwa onye anēto nke-uku: Onye anātu egwu Ya ka Ọ bu n'elu chi nile. 5 N'ihi na chi nile nke ndi nile di iche iche bu ihe-efu: Ma Jehova mere elu-igwe. 6 Ebube na ima-nma di n'iru Ya: Ike na nma di n'ebe nsọ Ya. 7 Nyenu Jehova, unu ab͕uru nke ndi nile di iche iche, Nyenu Jehova nsọpuru na ike. 8 Nyenu Jehova nsọpuru aha-Ya: Butenu onyinye-inata-iru-ọma, bata n'ogige-Ya nile. 9 Kpọnu isi ala nye Jehova n'ima-nma nke idi-nsọ: Ka o nēb͕u unu nb͕u site n'iru Ya, unu elu-uwa nile. 10 Sinu n'etiti mba nile, Jehova bu eze: Ọzọ, elu-uwa dum madu bi nēguzosi ike, adighi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya: Ọ gēkpe ndi nile di iche iche ikpe n'izi-ezi. 11 Ka elu-igwe ṅuria, ka uwa teghari kwa egwú ọṅù; Ka oké osimiri bib͕o, ya na ùjú-ya; 12 Ka ọhia ṅuria ọṅu-agha, ya na ihe nile nke di nime ya; Mb͕e ahu osisi nile nke oké ọhia gēti nkpu ọṅù; 13 N'iru Jehova, n'ihi na Ọ biawo; N'ihi na Ọ biawo ikpe uwa ikpe: Ọ gēji ezi omume kpe elu-uwa dum madu bi ikpe, Ọ gēji kwa ikwesi-ntukwasi-obi-Ya kpe ndi nile di iche iche ikpe.

Abù Ọma 97

1 Jehova bu eze; ka uwa tegharia egwu ọṅù; Ka ala bara uba nke di oké osimiri buruburu ṅuria. 2 Igwe-oji na oké ọchichiri di Ya buruburu: Ezi omume na ikpé ziri ezi bu ọnọdu guzosiri ike nke oche-eze-Ya. 3 Ọku nāga n'iru Ya, Nēsure kwa ndi-nkpab͕u-Ya buruburu. 4 Àmùmà-Ya nile nyere elu-uwa dum madu bi ìhè: Uwa huru ya, o we gbue ya nb͕u. 5 Ugwu nile b͕azepuru dika wax n'iru Jehova, N'iru Onye-nwe uwa nile. 6 Elu-igwe gosiri ezi omume-Ya, Ndi nile di iche iche hu-kwa-ra ebube-Ya. 7 Ka ihere me ndi nile ndi nēfè arusi apiri api òfùfè, Ndi nānya isi n'ihe-efu di iche iche: Kpọnu isi ala nya Ya, unu chi nile. 8 Zaion nuru, we ṅuria, Umu-ndinyom Juda we tegharia egwu ọǹù; N'ihi ikpé-Gi nile, Jehova. 9 N'ihi na Gi onwe-gi, Jehova, bú Onye kachasi ihe nile elu n'elu uwa nile: Emewo ka I di elu nke-uku n'elu chi nile. 10 Unu ndi nāhu Jehova n'anya, kpọnu ihe ọjọ asì: Ọ nēdebe nkpuru-obi ndi-ebere-Ya; Ọ nānaputa ha n'aka ndi nēmebi iwu. 11 Aghaworo onye ezi omume ìhè dika nkpuru, Aghawo-kwa-ra ndi ziri ezi n'obi ọṅù. 12 Ṅurianu na Jehova, unu ndi ezi omume; Kele-kwa-nu ihe-ncheta-Ya di nsọ.

Abù Ọma 98

1 Bùkuenu Jehova abù ọhu; N'ihi na Ọ luwo oké ọlu di iche iche; Aka-nri-Ya na ogwe-aka-Ya di nsọ enyewo Ya nzọputa. 2 Jehova emewo ka amara nzọputa-Ya: N'anya mba nile ka O kpugheworo ezi omume-Ya. 3 O chetawo ebere-Ya na ikwesi-ntukwasi-obi-Ya n'ebe ulo Israel di: Nsọtu nile nke uwa ahuwo nzọputa Chineke-ayi. 4 Tikusienu Jehova nkpu ọṅù ike, uwa nile: Tiwanu nkpu, tienu nkpu ọṅù, bùanu abù ọma. 5 Werenu ubọ-akwara bùkue Jehova abù ọma; Werenu ubọ-akwara na olu abù ọma. 6 Chirinu opì na olu opì-ikeTisie nkpu ọṅù ike n'iru Eze, bù Jehova. 7 Ka oké osimiri bib͕ọ, na ùjú-ya; Elu-uwa dum madu bi, na ndi bi nime ya; 8 Ka osimiri nile kua aka-ha; Ka ugwu tie nkpu ọṅù n'otù; 9 N'iru Jehova, n'ihi na Ọ biawo ikpe uwa ikpe: Ọ gēwere ezi omume kpe elu-uwa dum madu bi ikpe, Ọ gēwere kwa izi-ezi kpe ndi nile di iche iche.

Abù Ọma 99

1 Jehova bu eze; ka ndi nile di iche iche ma jijiji: Ọ nēbi n'etiti cherubim; ka uwa me nkpatu. 2 Jehova di uku nime Zaion; Onye di elu ka Ọ bu kwa n'elu ndi nile di iche iche. 3 Ka ha kele aha-Gi nke di uku, nke anātu kwa egwu ya: Onye nsọ ka Ọ bu. 4 Ike nke eze nāhu kwa ezi ikpé n'anya; Gi onwe-gi emewo ka izi-ezi guzosie ike, Ezi ikpé na ezi omume ka Gi onwe-gi meworo nime Jekob. 5 Bulienu Jehova, bú Chineke-ayi, elu, Kpọ-kwa-nu isi ala n'ebe ihe-nb͕akwasi-ukwu-Ya di: Onye nsọ ka Ọ bu. 6 Moses na Eron n'etiti ndi-nchu-àjà-Ya, Samuel kwa n'etiti ndi nākpọku aha-Ya; Ha nākpọku Jehova, Ya onwe-ya we za ha. 7 N'ogidi igwe-oji ka Ọ nāgwa ha okwu: Ha debere ihe-àmà-Ya nile, na ukpuru O nyere ha. 8 Jehova, bú Chineke-ayi, Gi onwe-gi zara ha: Chineke Nke nēbupu nmehie ka I buru ha, Ma I bu onye nābọ̀ ọ́bọ̀ omume nile ha, 9 Bulienu Jehova, bú Chineke-ayi, Kpọ-kwa-nu isi ala n'ebe ugwu nsọ Ya di; N'ihi na onye nsọ ka Jehova, bú Chineke-ayi, bu.

Abù Ọma 100

1 Tikusienu Johova nkpu ọṅù ike, uwa nile. 2 Werenu ọṅù fè Jehova òfùfè: Werenu iti-nkpu ọṅù bia n'iru Ya. 3 Maranu na Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke: Ya onwe-ya emewo ayi, ọ bu kwa Ya nwe ayi; Ayi bu ndi-Ya, na ìgwè aturu nke ọzùzù-anu-Ya. 4 Werenu ekele ba n'ọnu-uzọ-ama-Ya nile, Werenu otuto ba n'ogige-Ya nile: Kelenu Ya, gọzi-kwa-nu aha-Ya. 5 N'ihi na Jehova di nma; rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di; Rue ọb͕ọ nile ka ikwesi-ntukwasi-obi-Ya di kwa.

Abù Ọma 101

1 Ebere na ezi ikpé ka M'gābù n'abù: Gi, Jehova, ka m'gabùku abù ọma. 2 M'gēnwe uche n'uzọ zuru okè: Òle mb͕e I gābiakutem? M'gējeghari n'etiti ulom n'izu-okè nke obim. 3 M'gaghi-edo ihe jọb͕uru onwe-ya n'irum: Akpọwom ọlu nke ndi nējehie asì; Ọ gaghi-arapra n'arum. 4 Obi b͕agọro ab͕agọ gēsi n'ebe m'nọ wezuga onwe-ya: Ọ dighi onye ọjọ m'gāmara. 5 Onye nēkpè madu-ibe-ya ikpè na nzuzo, onye ahu ka m'gēkpochapu: Onye nwere anya npako na obi di nganga, onye ahu ka m'nāpughi inagide. 6 Anyam abua di n'aru ndi kwesiri ntukwasi-obi n'ala, ka mu na ha we biri: Onye nēje ije n'uzọ zuru okè, onye ahu gējerem ozi. 7 Onye nālu ọlu aghughọ agaghi-ebi n'etiti ulom: Onye nēkwu okwu-ugha agaghi-eguzosi ike n'iru anyam. 8 Kwa-ututu ka m'gēkpochapu ndi nile nēmebi iwu n'ala; Isi n'obodo Jehova kpochapu ndi nile nālu ajọ ihe.

Abù Ọma 102

1 Jehova, nuru ekperem, Ka ntikum ru kwa Gi nti. 2 Ezonarilam iru-Gi n'ubọchi ahuhu m'nāhu: Tọ nti-Gi n'ala n'ebe m'nọ; N'ubọchi m'nākpọku Gi zam ngwa ngwa. 3 N'ihi na ubọchim nile agwusiwo n'anwuru-ọku, Erechapuwo kwa ọkpukpum nile dika ọlọkọ-ọku. 4 Etib͕uwo obim dika ihe akuru n'ala, o we kpọnwua; N'ihi na echezọwom iri nrim. 5 Site n'olu ize-umemỌkpukpum araparawo n'anu-arum. 6 Eyirim okwolo nke ọzara; Aghọwom ihe dika okwukwu nke nkpọnkpọ ebe. 7 Amuruwom anya, we ghọIhe dika nnunu ntà nke nání ya nọ n'elu-ulo. 8 Ogologo ubọchi nile ka ndi-irom nātam uta; Ndi nāwi ara imegidem ejiwom ṅua iyi. 9 N'ihi na eriwom ntu dika nri, Were kwa ikwa-ákwá gwakọta ihe-ọṅuṅum. 10 Site n'iwe-Gi na ọnuma-Gi: N'ihi na I buliwom elu, we tufuem. 11 Ubọchim nile di ka onyinyo nke nēsetipu onwe-ya site n'ọdida anyanwu; Mu onwem nākpọnwu kwa dika ihe akuru n'ala. 12 Ma Gi onwe-gi, Jehova, nānọdu dika eze rue mb͕e ebighi-ebi; Ncheta-Gi nādiru kwa ọb͕ọ nile. 13 Gi onwe-gi gēbili, nwe obi-ebere n'aru Zaion: N'ihi na mb͕e eruwo imere ya amara, n'ihi na mb͕e akara àkà abiawo. 14 N'ihi na nkume-ya nile nātọ ndi-orù-Gi utọ, Ha nēme-kwa-ra ájá-ya amara. 15 Mba nile gātu kwa egwu aha Jehova, Eze nile nke uwa gātu kwa egwu ebube-Gi: 16 N'ihi na Jehova ewuwo Zaion, O mewo Onwe-ya ka ahú Ya nime ebube-ya. 17 O chewo ekpere nke onye nēnweghi ihe iru, O ledaghi kwa ekpere-ha anya. 18 Agēde nka n'akwukwọ nye ọb͕ọ nēso n'azu: Ọzọ, otù ndi nke agēkè gēto Ja. 19 N'ihi na O siwo n'ebe di elu nke ebe nsọ Ya lepu anya; Jehova esitewo n'elu-igwe legide uwa anya; 20 Inu ize-ume nke onye-nkpọrọ; Itọpu ndi nāghaghi inwu anwu; 21 Ka ha we kọ akukọ aha Jehova nime Zaion, Kọ kwa akukọ otuto-Ya nime Jerusalem; 22 Mb͕e ndi nile di iche iche gāchikọta onwe-ha n'otù, Ha na ala-eze nile, ifè Jehova òfùfè. 23 O wedawo ikem n'uzọ; O bilatawo ubọchim nile. 24 Asirim, Chinekem, emela ka m'la n'elu n'etiti ubọchim nile: N'ọb͕ọ nile ka arọ-gi nādigide. 25 Na mb͕e ochie ka I tọrọ ntọ-ala nke uwa; Ọlu aka-Gi ka elu-igwe bu kwa. 26 Ha onwe-ha gāla n'iyì, ma Gi onwe-gi nēguzogide: Ha nile gāka kwa nká dika uwe; Dika ákwà-nb͕okwasi ka I gāb͕anwe ha, agāb͕anwe kwa ha: 27 Ma Gi onwe-gi bu Onye ahu Nke nādi mb͕e nile, Arọ-Gi nile agaghi-agwu kwa agwu 28 Umu nke ndi-orù-Gi gēbigide, Nkpuru-ha gēguzosi ike n'iru Gi.

Abù Ọma 103

1 Gọzie Jehova, nkpuru-obim; Ka ihe nile nke di nimem gọzi kwa aha nsọ Ya. 2 Gọzie Jehova, nkpuru-obim, Echezọ-kwa-la nmeso ọma Ya O nēmeso gi: 3 Bú Onye nāb͕aghara gi ajọ omume-gi nile; Onye nāgwọ ọria-gi nile; 4 Onye nāb͕aputa ndu-gi n'aka nbibi; Onye nēkpube gi okpu-eze, bú ebere na obi-ebere di iche iche: 5 Onye nēwere ezi ihe me ka afọ ju ọnu-gi; Idi-na-nwata-gi ewe me onwe-ya ka ọ di ọhu dika ugo. 6 Jehova nēmere ndi nile anēmeb͕uEzi omume nile na ihe nile O kpere n'ikpe. 7 Ọ nēme ka Moses mara uzọ-Ya nile, Ọ nēme kwa ka umu Israel mara omume-Ya nile. 8 Jehova nwere obi-ebere, nēme kwa amara, Ọ dighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ nāba kwa uba n'ebere. 9 Ọ bughi rue mgbe nile ka Ọ ganēse okwu; Ọ bughi kwa rue mb͕e ebighi-ebi ka Ọ ganēdebe iwe. 10 Ọ bughi dika nmehie nile ayi si di ka O meworo ayi, Ọ bughi kwa dika ajọ omume nile ayi si di ka O mesoworo ayi. 11 N'ihi na dika idi-elu nke elu-igwe si di n'elu uwa, Otú a ka ebere-Ya di ike n'aru ndi nātu egwu Ya. 12 Dika Iru-anyanwu si di anya n'Ọdida-anyanwu, Otú a ka O meworo ka njehie nile ayi di anya n'ebe ayi nọ. 13 Dika nna si enwe obi-ebere n'aru umu-ya, Otú a ka Jehova nwere obi-ebere n'aru ndi nātu egwu Ya. 14 N'ihi na Ya onwe-ya mara otú akpuworo ayi; Ọ nēcheta na ájá ka ayi bu. 15 Ma madu, dika ahihia ka ubọchi-ya nile di; Dika okoko-osisi ọhia, otú a ka ọ nāwa okoko. 16 N'ihi na ifufe agabigawo ya n'isi, o we ghara idi; Ọnọdu-ya agaghi-ama kwa ya ọzọ. 17 Ma ebere nke Jehova nēsi na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi n'aru ndi nātu egwu Ya, Ezi omume-Ya di-kwa-ra umu umu; 18 Ọ diri ndi nēdebe ọb͕ub͕a-ndu-Ya, Di-kwa-ra ndi nēcheta ukpuru-Ya ime ha. 19 Jehova emewo ka oche-eze-Ya guzosie ike n'elu-igwe; Ala-eze-Ya nāchi kwa ihe nile. 20 Gọzienu Jehova, ndi-mọ-ozi-Ya, Unu ndi-dike di ike, ndi nēme okwu-Ya, N'ige nti olu nke okwu-Ya. 21 Gọzienu Jehova, usu-ndi-agha-Ya nile; Unu ndi nējere Ya ozi, ndi nēme ihe nātọ Ya utọ. 22 Gọzienu Jehova, unu ọlu-Ya nile, N'ebe nile Ọ nāchi: Gọzie Jehova, nkpuru-obim.

Abù Ọma 104

1 Gọzie Jehova, nkpuru-obim. Jehova, Chinekem I di uku nke-uku; Ebube na ima-nma ka I yiriworo dika uwe. 2 Gi Onye nēji ìhè kpuchi Onwe-gi dika uwe-nb͕okwasi; Onye nēseti elu-igwe dika ákwà-nkwuba: 3 Onye nēdo ihe-njikọta nke ime-ulo-elu-Ya nile nime miri: Onye nēme igwe-oji ka ha buru ub͕ọ-ala-Ya; Onye nējeghari n'elu nkù abua nke ifufe: 4 Onye nēme ndi-mọ-ozi-Ya ka ha buru ifufe; Nēme kwa ndi nējere Ya ozi ka ha buru ọku nēnwu enwu: 5 Ọ tọwo ntọ-ala uwa n'elu ọnọdu-ya guzosiri ike, Ka aghara iwezuga ya n'ọnọdu-ya rue mb͕e nile ebighi-ebi. 6 I were ob͕u-miri kpuchie ya dika uwe; N'elu ugwu nile ka miri nēguzo. 7 Site n'ibasi-nba-ike-Gi ha nāb͕alaga; Site n'olu éb͕è-elu-igwe-Gi ha nāzọli ọsọsọ; 8 (Ugwu nile nārigo, ndagwurugwu nile nārida; )Rue ebe ahu nke I tọrọri ntọ-ala-ya nye ha. 9 I kpawo ókè ka ha we ghara igabiga ya; Ka ha we ghara ilaghachi ikpuchi uwa. 10 Gi Onye nēzipu isi-iyi di iche iche ka ha ba na ndagwurugwu; N'etiti ugwu ka ha nērù: 11 Ha nēnye anu ọhia ọ bula miri iṅu; Inyinya-ibu-ọhia nēmeju akpiri-ikpọ-nku-ha. 12 N'akuku ha ka anu-ufe nke elu-igwe bi, Ha nēsi n'etiti alaka-osisi me ka olu-ha da udà. 13 I bu Onye nēsi n'ime-ulo-elu-Ya nile dè ugwu nile miri: Afọ nēju uwa site na nkpuru nke ọlu-Gi nile. 14 I bu Onye nēme ka ahihia puere anu-uloNēme kwa ka ihe akuru n'ala puere ọlu-ubi madu; Ime ka nri si n'ala puta: 15 Na manya-vine nke nēme ka obi madu ṅuria, Ime ka iru-ya nēb͕upu site na manu, Na achicha nke nēme ka madu nwe ume n'obi. 16 Afọ nēju osisi nile nke Jehova; Bú osisi cedar nke Lebanon, nke Ọ kuworo; 17 Ebe umu-nnunu na-akù akwú: Ub͕ala, osisi fir bu ulo-ya. 18 Ugwu nile di elu diri ewu-ọhia; Nkume nile di elu buru aṅu ebe-nb͕abà. 19 O mere ọnwa ka ọ buru ihe igu mb͕e di iche iche akara àkà: Anyanwu mara ọdida-ya. 20 I nēme ka ọchichiri b͕a, o we buru abali; Nime ya ka anu nile nke oké ọhia nākpuputa. 21 Umu-ọdum nāb͕ọ uja na-achọ anu ha gādọb͕u, N'ichọ kwa ihe-oriri-ha n'aka Chineke. 22 Anyanwu nāwa, ha we chikọta onwe-ha, We mākpuru n'ebe-obibi-ha di iche iche. 23 Madu nāpu ga ọlu-yaGa kwa ọlu-ubi-ya rue anyasi. 24 Le ka ọlu-Gi si ba uba nke-uku, Jehova! N'amam-ihe ka I meworo ha nile: Uwa juputara n'ihe I nwetara. 25 Oké osimiri ka nka bu, nke di uku, nke sa-kwa-ra mbara n'aka abua, Ebe ihe nākpu akpu di nke nādighi ọnu-ọgugu, Anu di iche iche, ma anu ntà ma anu uku. 26 N'ebe ahu ka ub͕ọ nile nāga; Leviatham kwa, nke I kpuworo igwuri egwú nime ya. 27 Ha nile nēle anya Gi, Inye ha ihe-oriri-ha na mb͕e-ya. 28 I nēnye ha, ha achikọta ya; I nāsaghe aka-Gi, afọ ezi ihe eju ha. 29 I nēzobe iru-Gi, ha ama jijiji; I nāchikọta mọ-ha, ha ekubìe ume, We laghachi n'ájá-ha. 30 I nēzipu Mọ-Gi, ekè ha; I we me ka iru ala di ọhu. 31 Ka ebube Jehova dirue mb͕e ebighi-ebi; Ka Jehova ṅuria n'ọlu-Ya nile: 32 Onye nēlegide uwa, o we ma jijiji; Ọ nēmetu ugwu aka, ha we kwua anwuru-ọku. 33 M'gābùku Jehova abù n'ogologo ndum nile: M'gābùku Chinekem abù ọma mb͕e m'nọ nādi ndu. 34 Ka ntughari-uchem tọ Ya utọ: Mu onwem gāṅuri ọṅu nime Jehova. 35 Ka eme ka ndi-nmehie si n'uwa gwusia, Ka ndi nēmebi iwu ghara kwa idi ọzọ. Gọzie Jehova, nkpuru-obim. Tonu Ja.

Abù Ọma 105

1 Kelenu Jehova, kpọkuenu aha-Ya; Menu ka amara omume-Ya nile n'etiti ndi nile n'uwa. 2 Bùkuenu Ya abù, bùkuenu Ya abù ọma; Tugharinu uche n'oké ọlu-Ya nile. 3 Nētonu onwe-unu n'aha nsọ Ya: Ka obi ndi nāchọ Jehova ṅuria. 4 Nāchọnu Jehova na ike-Ya; Chọnu iru-Ya mb͕e nile. 5 Chetanu oké ọlu-Ya nile nke Ọ luworo; Ihe-ebube-Ya nile, na ikpé nile nke ọnu-Ya; 6 Unu nkpuru Abraham, bú orù-Ya, Umu Jekob, ndi-Ya arọputara. 7 Ya onwe-ya bu Jehova, bú Chineke-ayi: N'uwa nile ka ikpé-Ya nile di. 8 O chetawo ọb͕ub͕a-ndu-Ya rue mb͕e ebighi-ebi, Okwu O nyere nnù ọb͕ọ abua na ọgu iri n'iwu; 9 Ọb͕ub͕a-ndu nke Ya na Abraham b͕ara, Na iyi-Ya Ọ ṅuru Aisak; 10 O we me ka o guzoro Jebok ibu ukpuru, Ka o guzoro Israel ibu ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi: 11 Si, Gi ka M'gēnye ala Kenean, Bú ala-nketa-unu eji udọ̀ tùa: 12 Mb͕e ha bu ndikom ole-na-ole, E, nání madu ole-na-ole, na ndi-ọbìa nime ya; 13 Ha we nējeghari si n'otù mba jerue mba ọzọ, Si n'otù ala-eze jerue ndi ọzọ. 14 Ọ kweghi ka nwoke ọ bula meb͕ue ha; O we bara ndi-eze nba n'ihi ha; 15 Si, Unu emetula ndim etere manu aka, Unu emejọ-kwa-la ndi-amumam. 16 O we kpọ oké unwu ka ọ biakwasi ala ahu; Nkpa-n'aka nile, bú achicha, ka Ọ kpajiri. 17 O zìri otù nwoke iga n'iru ha; Erere Josef ka ọ buru orù: 18 Ha were ab͕u kesie ukwu-ya abua ike; Nkpuru-obi-ya bàra n'ígwè: 19 Rue mb͕e okwu-Ya rère; Okwu-ọnu Jehova nuchara ya. 20 Eze ziri ozi, we tọpu ya; Bú onye nāchi ndi di iche iche, o we tupu ya n'ulo-nkpọrọ. 21 O mere ya ka ọ buru onye-nwe ulo-ya, Na onye nāchi ihe nile o nwetara: 22 Ike ndi-isi-ya ab͕u dika nkpuru-obi-ya chọrọ, Na ime ka ndi-okenye-ya mara ihe. 23 Israel we bata nime Ijipt; Ọzọ, Jekob nọrọ dika ọbìa n'ala Ham. 24 O we me ka ndi-Ya mia nkpuru nke-uku; O we me ka ha nwe ume kari ndi nākpab͕u ha. 25 Ọ b͕anwere obi-ha ikpọ ndi-Ya asì, Ib͕agide ndi-orù-Ya ìzù ọjọ. 26 O zigara Moses, bú orù-Ya, Na Eron onye Ọ rọputara. 27 Ha doro n'etiti ha ihe iriba-ama-Ya nile, Do kwa ihe-ebube di iche iche n'ala Ham. 28 O zìri ọchichiri, we me ka ọ b͕achie; Ha anupughi kwa isi n'okpuru okwu-Ya nile. 29 Ọ b͕anwere miri-ha ka ha ghọ ọbara, We me ka azù-ha nwua. 30 Ala-ha nuputara awọ, N'ime-ulo nile nke ndi-eze-ha. 31 O kwuru okwu, odudu we bia, Na anwu ntà n'ókè-ala-ha nile. 32 O mere oké miri-ozuzo-ha ka ha ghọ ákú-miri-ígwé, Na ọku nēnwu enwu n'ala-ha. 33 O we tie osisi vine nile ha na osisi fig nile ha ihe; Tiji kwa osisi nke ókè-ala-ha. 34 O kwuru okwu, igurube we da, Ha na umu-igurube nādighi ọnu-ọgugu, 35 Ha we richapu ihe-ọkukú ọ bula di n'ala-ha, Richapu kwa nkpuru nke ala-ubi-ha. 36 O tib͕u-kwa-ra umu nile eburu uzọ mu n'ala-ha, Bú nkpuru mbu nke ume-ha nile. 37 O we me ka ha puta chiri ọla-ọcha na ọla-edo: Ọ dighi kwa onye nāsu ngọngọ n'etiti ebo-Ya nile. 38 Ijipt ṅuriri mb͕e ha putara; N'ihi na oké egwu-ha dakwasiri ha. 39 Ọ b͕asara igwe-oji ibu ihe-nkpuchi; Na ọku inye ìhè n'abali. 40 Ha riọrọ, O we me ka nnunu quail bia, O were kwa nri nke elu-igwe me ka afọ ju ha. 41 O meghere oké nkume, miri we rùputa; Ha nērù n'ala ọkpọ-nku dika osimiri. 42 N'ihi na O chetara okwu nsọ Ya, Na Abraham, bú orù-Ya. 43 O we me ka ndi-Ya ji obi-utọ puta, Me kwa ndi Ọ rọputaworo ka ha ji iti-nkpu-ọṅù puta. 44 O we nye ha ala nile nke mba Kenean nile; Ọ bu kwa ihe ndi ọzọ di iche iche dọb͕uru onwe-ha n'ọlu inwe ka ha nwetara: 45 Ka ha we debe ukpuru-Ya nile, Riba kwa iwu-Ya nile ama. Tonu Ja.

Abù Ọma 106

1 Tonu Ja. Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. 2 Ònye gākọ akukọ idi-ike nile nke Jehova? Ònye gēme ka anuru otuto-Ya nile? 3 Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nēdebe ikpé bu, Ha na onye nēme ezi omume na mb͕e nile. 4 Chetam, Jehova, were ka ihe ndi-gi si atọ Gi utọ chetam; Were nzọputa-Gi letam: 5 Ka m'we lekwasi ọdi-nma nke ndi I rọputaworo, Ka m'we ṅuria n'ọṅù mba-Gi, Ka m'we soro ihe-nketa-Gi nya isi. 6 Ayi esowo nna-ayi-hà mehie, Ayi emewo ajọ omume, ayi emebiwo iwu. 7 Nna-ayi-hà enweghi uche ighọta oké ọlu-Gi nile n'Ijipt; Ha echetaghi iba-uba nke ebere-Gi nile; Ha we nupu isi n'akuku oké osimiri, bú n'Oké Osimiri Uhie. 8 Ma Ọ zọputara ha n'ihi aha-Ya, Ime ka amara idi-ike-Ya. 9 O we basiere Oké Osimiri Uhue nba, o we tasia: O we me ka ha nēje ije n'ob͕u-miri-ya nile dika ọ bu ọzara. 10 O we zọputa ha n'aka onye nākpọ ha asì, B͕aputa kwa ha n'aka onye-iro-ha. 11 Miri we kpuchie ndi nākpab͕u ha: Ọ dighi otù onye nime ha fọduru. 12 Ha we kwere okwu-Ya nile; Ha nābù abù otuto-Ya. 13 Ha chezọrọ ọlu-Ya nile ngwa ngwa; Ha echeghi ndum-ọdu-Ya: 14 Ha we chọ ajọ ọchichọ n'ọzara, We nwa Chineke n'ala tọb͕ọrọ n'efu. 15 O we nye ha ihe ha riọrọ; Ma O zitere aru-ọtita na nkpuru-obi-ha. 16 Ha kwo-kwa-ra Moses ekworo n'ọmuma-ulo-ikwū-ha, Kwo kwa Eron, bú onye nsọ nke Jehova. 17 Ala nēmeghe, we loda Detan, Kpuchi kwa nzukọ Abairam. 18 Ọku we nēre n'etiti nzukọ-ha; Ire-ọku nērepia ndi nēmebi iwu. 19 Ha nēme nwa-ehi na Horeb, We kpọ isi ala nye ihe awuru awu. 20 Ha we b͕anwe nsọpuru-haN'ihe-atù nke ehi nāta ihe akuru n'ala. 21 Ha chezọrọ Chineke, bú Onye-nzọputa-ha, Onye nēmeri ihe uku di iche iche n'Ijipt; 22 Oké ọlu di iche iche n'ala Ham, Na ihe di egwu di iche iche n'akuku Oké Osimiri Uhie. 23 O we si na O gēkpochapu ha, Ma ọ buru na Moses, bú onye Ọ rọputaworo, eguzoghi na ntiwa ahu n'iru Ya, Ime ka ọnuma-Ya si n'ibibi ha laghachi. 24 Ọzọ, ha juru ala anāchọsi ike, Ha ekweghi okwu-Ya; 25 Ha we tamu n'ulo-ikwū nile ha, Ha egeghi nti n'olu Jehova. 26 O we welie aka-Ya elu n'ebe ha nọ, Ime ka ha da n'ọzara: 27 Na ime ka nkpuru-ha da n'etiti mba nile, Na ichusa ha n'ala nile. 28 Ha kekọta-kwa-ra onwe-ha n'aru Beal-peoa, We rie àjà nile nke ihe nwuru anwu. 29 Ha we were omume nile ha kpasue Ya iwe: Ihe-otiti we dakwasi ha. 30 Finehas wee guzo ọtọ, me ihe ekpere n'ikpe: Ewe b͕ochi ihe-otiti ahu. 31 Ewe guara ya nka n'ezi omume, Rue ọb͕ọ nile rua mb͕e ebighi-ebi. 32 Ha kpasu-kwa-ra Ya iwe na miri Meriba, O we jọrọ Moses njọ n'ihi ha: 33 N'ihi na ha nupuru isi n'okpuru Mọ-Ya, O we were eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua kwue okwu efu. 34 Ha ekpochapughi ndi di iche iche ahu, Dika Jehova siri ha; 35 Ma ha gwakọtara onwe-ha na mba nile nke ala ahu, We muta ọlu nile ha: 36 Ha we fè arusi nile ha òfùfè; Arusi ahu we ghọrọ ha ọnyà: 37 Ọzọ, ha were umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom chuara ndi-mọ ọjọ àjà, 38 We wusi ọbara nke nēmeghi ihe ọjọ, bú ọbara nke umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom, Ndi ha were chuara arusi nile nke Kenean àjà; Ewe were ọbara merua ala ahu. 39 Ewe were ọlu nile ha me ka ha buru ihe ruru árú, Ha we nākwa iko n'omume nile ha. 40 Iwe Jehova we di ọku n'aru ndi-Ya, O we kpọ ihe-nketa-Ya ihe-árú. 41 O we nye ha n'aka mba di iche iche; Ndi nākpọ ha asì we nāchi ha. 42 Ndi-iro-ha meb͕u-kwa-ra ha, Ewe me ka ha ruru ala n'okpuru aka-ha. 43 Ọtutu mb͕e ka Ọ nanaputa ha; Ma ha onwe-ha nānupu isi n'okpuru Chineke na ndum-ọdu-ha, Ewe kwada ha n'ajọ omume-ha. 44 O we lekwasi ahuhu diri ha anya, Mb͕e Ọ nuru iti-nkpu-ha: 45 O we cheta ọb͕ub͕a-ndu-Ya nye ha, We chègharia dika iba-uba nke ebere-Ya nile si di. 46 O we me ha ka enwe obi-ebere nile n'aru haN'iru ndi nile ndi nādọta ha n'agha. 47 Zọputa ayi, Jehova, bú Chineke-ayi, Chikọputa kwa ayi n'etiti mba nileIkele aha nsọ Gi, Na inya isi n'otuto-Gi. 48 Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke nke Israel, bu, Site na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi. Ka ndi Israel nile si kwa, Amen. Tonu Ja.

AKWUKWỌ NKE-ISE

Abù Ọma 107

1 Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. 2 Ka ndi Jehova b͕aputaworo nāsi otú a, Bú ndi Ọ b͕aputaworo n'aka onye-nkpab͕u; 3 O si-kwa-ra n'ala nile chikọputa ha, Site n'Iru-anyanwu na site n'Ọdida-anyanwu, Site n'Ugwu na site n'oké osimiri. 4 Ha fughariri n'ọzara n'uzọ nke bu nání ala tọb͕ọrọ n'efu; Ọ dighi obodo obibi ha chọtara. 5 Ndi agu nāgu na ndi akpiri nākpọ nku ka ha bu, Nkpuru-obi-ha adighi-enwe ike nime ha. 6 Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha, O we naputa ha n'aka nkpà-ha nile. 7 O me-kwa-ra ka ha zọ ije n'uzọ ziri ezi, Ijeru obodo obibi. 8 Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya, Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu! 9 N'ihi na O mewo ka afọ ju nkpuru-obi nāchọsi ihe ike, Ọ bu kwa nkpuru-obi agu nāgu ka O nyejuworo ezi ihe. 10 Ndi nānọdu n'ọchichiri na onyinyo ọnwu, Bú ndi-nkpọrọ nke nweda-n'ala na ígwè; 11 N'ihi na ha nupuru isi n'okpuru okwu Chineke, Lelì kwa ndum-ọdu nke Onye kachasi ihe nile elu: 12 O we me ka obi-ha ruru ala n'idọb͕u onwe-ha n'ọlu; Ha suru ngọngọ, ọ dighi kwa onye nēyere ha aka. 13 Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha, O we zọputa ha n'aka nkpà-ha nile. 14 O nēme ka ha si n'ọchichiri na onyinyo ọnwu puta, Ọ nētiji kwa ab͕u nile ha. 15 Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya, Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu! 16 N'ihi na O tipiawo ibo-ọnu-uzọ nile nke ọla, B͕uji kwa ihe-ntuchi nile nke ígwè. 17 Ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche neweda onwe-ha n'alaSite n'uzọ njehie-ha na site n'ajọ omume nile ha. 18 Ihe-oriri nile ọ bula ka nkpuru-obi-ha nākpọ ihe-árú; Ha we biarue nso ọnu-uzọ-ama nile nke ọnwu. 19 Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha, O we zọputa ha na nkpà-ha nile. 20 O nēzite okwu-Ya, we me ka aru di ha nma, O nēme kwa ka ha si n'olùlù nile ha wepuga onwe-ha. 21 Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya, Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu! 22 Ka ha chu kwa àjà nile nke ekele, Were kwa iti-nkpu-ọṅù kọ akukọ ọlu-Ya nile. 23 Ndi nārida n'oké osimiri n'ub͕o, Bú ndi nēje ozi n'ọtutu miri; 24 Ndi ahu ahuwo ọlu nile nke Jehova, Na oké ọlu-Ya nile nime miri nke miri emi. 25 N'ihi na Ọ nēkwu okwu, O we me ka oké ifufe guzo ọtọ, Nke nēbuli nmali-miri-ya nile elu. 26 Ha nārigoru elu-igwe, ha nāridaru ob͕u-miri nile: Nkpuru-obi-ha nālọ miri site n'ọnọdu ọjọ ha. 27 Ha nādaghari, nāṅaghari kwa dika onye ṅubigaworo manya ókè, Amam-ihe-ha nile nāla kwa n'iyì. 28 Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha, Ọ we me ka ha puta na nkpà-ha nile. 29 Ọ nēme ka oké ifufe guzo n'idere du, Nmali-miri-ya nile we b͕a nkiti. 30 Ha we ṅuria, n'ihi na ha nādaju; O we durue ha n'ótú nātọ ha utọ. 31 Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya, Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu! 32 Ka ha me kwa Ya ka Ọ di elu nime nkpọkọta ndi-Ya, Ka ha to kwa Ya nime nnọkọ ndi-okenye. 33 O nēme ka osimiri ghọ ọzara, O nēme kwa ebe miri nāsuputa ka ha ghọ ala kpọro nku; 34 Ala nke nāmi nkpuru ka ọ ghọ ala nnú nnú, Site n'ihe ọjọ nke ndi bi nime ya nēme. 35 Ọ nēme ka ọzara ghọ ọdọ-miri juputara na miri, Ọ nēme kwa ka ala nke kpọrọ nku ghọ ebe miri nāsuputa. 36 O we me ka ndi agu nāgu biri n'ebe ahu, Ha we dozie obodo obibi; 37 Gha nkpuru n'ubi, kua ubi-vine di iche iche, Nweta nkepuru nke ihe-ọmume. 38 Ọ nāgọzi kwa ha, ha we ba uba nke-uku; Ọ dighi-eme kwa ka anu-ulo-ha bilata. 39 Ọzọ, ha nēbilata, we ruda n'ala, Site na nmeb͕u, na ihe ọjọ, na iru-újú. 40 Ọ nāwusa nleda n'aru ndi amara aha-ha, We me ka ha kpafue nebe tọb͕ọrọ n'efu, ebe uzọ nādighi. 41 Ọzọ, Ọ nēme ka ob͕eye si na nweda-n'ala nọ n'ebe di elu, Ọ nēme kwa ka ọ ghọ ab͕uru dika ìgwè ewu na aturu. 42 Ndi ezi omume nāhu ya, we ṅuria; Ma ajọ omume nile ekpuchiwo ọnu-ya. 43 Onye ọ bula nke mara ihe gāriba kwa ihe ndia ama, Ha gātukwasi kwa uche n'ebere nile nke Jehova.

Abù Ọma 108

1 Edoziwo obim, Chineke; M'gābù abù, e, m'gābù abù ọma, ọbuná nsọpurum ka m'gēji bù abù. 2 Teta, une na ubọ-akwara: M'gākpọte chi-ọbubọ. 3 M'gēkele Gi n'etiti ndi nile di iche iche, Jehova: M'gābùku kwa Gi abù ọma netiti mba nile. 4 N'ihi na ebere-Gi di uku kari elu nke elu-igwe, Ezi-okwu-Gi di kwa uku rue mbara-ígwé. 5 Me Onwe-gi ka I di elu n'elu elu-igwe nile, Chineke: Ka ebube-Gi di kwa n'elu uwa nile. 6 Ka ewe dọputa ndi I huru n'anya, Were aka-nri-Gi zọputa, za kwa ayi. 7 Chineke ekwuwo okwu n'idi-nsọ-Ya: ka m'ṅuria ọṅu-agha: M'gēkè Shekem, tù kwa ndagwurugwu Sukot. 8 Mu nwe Gilead; mu nwe Manase; Efraim bu kwa ebe siri ike nke isim; Juda bu nkpa-n'aka-ezem. 9 Moab bu ite ọsisa-arum; N'elu Edom ka m'gātu akpukpọ-ukwum: N'aru Filsitia ka m'gēti nkpu. 10 Ònye gēdubàm nke-ọma n'obodo ewusiri ike? Ònye duruworom rue Edom? 11 Ọ̀ bughi Gi, Chineke, juworo ayi aju? I dighi-apu kwa ije agha n'etiti usu nile nke ndi-agha-ayi, Chineke. 12 Yere ayi aka ka ayi pua n'aka onye-nkpab͕u: N'ihi na ihe-efu ka nzọputa madu bu. 13 Nime Chineke ayi gēme ihe dìnkpà: Ọ bu kwa Ya onwe-ya gāzọda ndi nākpabu ayi.

Abù Ọma 109

1 Chineke nke otutom, ab͕ala nkiti; 2 N'ihi na ọnu onye nēmebi iwu na ọnu aghughọ ka ha sagheworo megidem: Ha ewerewo ire okwu-ugha gwam okwu. 3 Ha ewerewo kwa okwu ikpọ-asì b͕am buruburu, We busom agha n'efu. 4 N'ọnọdu ihu-n'anya m'huru ha ha nēmegidem: Ma mu onwem nọ nēkpe ekpere. 5 Ha we tukwasim ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe, Na ikpọ-asì n'ọnọdu ihu-n'anyam. 6 Me ka onye nēmebi iwu lekọta ya: Ka onye-nmegide guzo kwa n'aka-nri-ya. 7 Mb͕e anēkpe ya ikpe, ya puta ìhè na ọ bu onye ikpe mara; Ka ekpere-ya ghọ kwa nmehie. 8 Ka ubọchi-ya di ole-na-ole; Ka onye ọzọ nara ya ihe-nlekọta-ya. 9 Ka umu-ya buru umu-nb͕ei, Ka nwunye-ya buru nwayi di-ya nwuru. 10 Ka umu-ya nāṅaghari kwa mb͕e nile nāriọ kwa aririọ; Ka ha si kwa na nkponkpọ-ebe-ha nile nāchọ ihe-oriri-ha n'ebe di anya. 11 Ka onye-nbinye siri ihe nile o nwere ọnyà; Ka ndi ala ọzọ luta ihe ọ dọb͕uru onwe-ya n'ọlu inweta n'agha. 12 Ekwela ka o nwe onye nọ nēmere ya ebere; Ekwe-kwa-la ka onye ọ bula di nke nēmere umu-nb͕ei-ya amara. 13 Ka eriri-umu-ya diri nbipu; N'ọb͕ọ soro ha ka ehichapu aha-ha. 14 Ka echetara Jehova ajọ omume nna-ya-hà; Ekwe-kwa-la ka ehichapu nmehie nne-ya. 15 Ka ha di n'iru Jehova mb͕e nile, Ka O we bipu ncheta-ha n'uwa. 16 N'ihi na o chetaghi ime ebere, O we sob͕ue nwoke ewedara n'ala na ob͕eye, Na onye obi-ya mebiri emebi, ime ka ha nwua. 17 Ọ hu-kwa-ra nkọcha n'anya, o we biakute ya; Ngọzi atọghi kwa ya utọ, o we di anya n'ebe ọ nọ. 18 O yiri-kwa-ra nkọcha dika uwe-nwuda-ya, O we ba nime ya dika miri, Ba kwa n'ọkpukpu-ya nile dika manu. 19 Ya diri ya ka uwe oji kpuchi onwe-ya, Ya buru kwa akpukpọ-úkwù o ji ke úkwù mb͕e nile. 20 Nka bu ugwọ-ọlu nke ndi nēmegidem, nke nēsi n'aka Jehova bia, Ọ bu kwa ugwọ-ọlu nke ndi nēkwu ihe ọjọ megide nkpuru-obim. 21 Ma Gi onwe-gi, Jehova, bú Onye-nwe-ayi, kwe ka mu na I mekọ n'ihi aha-Gi: N'ihi na ebere-Gi di nma, naputam. 22 N'ihi na onye ewedara n'ala na ob͕eye ka m'bu, Adupuwo kwa nkpuru-obim nimem. 23 Dika onyinyo mb͕e ọ nēsetipu onwe-ya site n'ọdida anyanwu, otú a ka m'laworo: Arurupuwom dika igurube. 24 Ikperè-ukwum abua asuwo ngọngọ site n'obubu-ọnu; Anu-arum nāta aru nēnweghi abuba. 25 Mu onwem, aghọwo-kwa-ram ha ihe-ita-uta: Mb͕e ha nāhum ha nēfufe isi-ha. 26 Yerem aka, Jehova, Chinekem; Zọputam dika ebere-Gi si di: 27 Ka ha mara kwa na aka-Gi ka nka bu; Gi onwe-gi, Jehova, emewo ya. 28 Ndi ahu gākọcha, ma Gi onwe-gi nāgọzi: Ha ebiliwo, ihere we me ha, ma orù-Gi gāṅuri. 29 Ndi nēmegidem gēyiri ọnọdu-ihere dika uwe, Ha gēwere kwa ihere-ha kpuchie onwe-ha dika uwe-nwuda. 30 M'gēwere ọnum kele Jehova nke-uku; E, n'etiti ọtutu madu ka m'gēto Ya. 31 N'ihi na O gēguzo n'aka-nri nke ob͕eye, Izọputa ya n'aka ndi nēkpe nkpuru-obi-ya ikpe.

Abù Ọma 110

1 Ihe nke si n'ọnu Jehova puta nāsi onye-nwem, Nọdu ala n'aka-nrim, Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-gi ka ihe-nb͕akwasi diri ukwu-gi abua. 2 Nkpa-n'aka nke ike-gi ka Jehova gēsi na Zaion ziputa: Gi nwe ike n'aru madu n'etiti ndi-iro-gi. 3 Ndi-gi bu onyinye-afọ-ofufo n'ubọchi usu-ndi-agha-gi; N'ima-nma nile nke idi-nsọ, site n'afọ nke ututu; Gi nwe igirigi, bú umu-okorọbia-gi. 4 Jehova aṅuwo iyi, Ọ gaghi-echèghari kwa uche-Ya, Gi onwe-gi bu onye-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebiDika usoro Melkizedek si di. 5 Onye-nwe-ayi n'aka-nri-giAmapúwo ndi-eze n'ubọchi iwe-Ya. 6 Ọ gēkpe ikpe n'etiti mba nile, Ebe nile juputara n'ozu; Ọ mapúwo isi madu n'elu ọtutu ala. 7 Miri nke sitere na miri-iyi nke di n'uzọ ka Ọ gāṅu: N'ihi nka ka Ọ gēweli isi-Ya elu.

Abù Ọma 111

1 Tonu Ja. M'gēwere obim nile kele Jehova, N'ìzu nzuzo nke ndi ziri ezi, na nime nzukọ Israel. 2 Ọlu nile nke Jehova di uku, Buru ihe ndi nile ha nātọ utọ nāchọputa. 3 Ebube na ima-nma ka ọlu-Ya bu: Ezi omume-Ya nēguzo kwa rue mb͕e ebighi-ebi. 4 Ihe-ncheta ka O meworo nye oké ọlu-Ya nile: Onye nēme ebere na Onye nwere obi-ebere ka Jehova bu. 5 Anu-ndọb͕u ka O nyeworo ndi nātu egwu Ya: Ọ gēcheta ọb͕ub͕a-ndu-Ya rue mb͕e ebighi-ebi. 6 O gosiwo ndi-Ya ike nke ọlu-Ya nile, N'inye ha ihe-nketa mba nile. 7 Ọlu nile nke aka-Ya bu ezi-okwu na ikpé ziri ezi; Ihe kwesiri ntukwasi-obi ka ukpuru-Ya nile bu. 8 Ihe anākwagide rue mb͕e nile ebighi-ebi ka ha bu, Ha bu ihe anēme n'ezi-okwu na izi-ezi. 9 Nb͕aputa ka O ziteworo ndi-Ya; O nyewo ọb͕ub͕a-ndu-Ya iwu rue mb͕e ebighi-ebi: Ihe di nsọ na ihe anātu egwu ka aha-Ya bu. 10 Nmalite amam-ihe ka egwu Jehova bu; Ezi uche ka ndi nile nēme ha nwere: Otuto-Ya nēguzo rue mb͕e ebighi-ebi.

Abù Ọma 112

1 Tonu Ja. Onye ihe nāgara nke-ọma ka nwoke ahu bu nke nātu egwu Jehova. Nke ihe nile O nyere n'iwu nātọ utọ nke-uku. 2 Ndi-dike ka nkpuru-ya gābu n'uwa: Agāgọzi ọb͕ọ ndi ziri ezi. 3 Ihe di iche iche di oké ọnu-ahia na àkù di n'ulo-ya: Ezi omume-ya nēguzo kwa rue mb͕e ebighi-ebi. 4 Ihè awaliwo n'ọchichiri nye ndi ziri ezi: Ọ bu onye-amara, na onye nwere obi-ebere, na onye ezi omume. 5 Ọ diri nwoke ahu nma, bú onye nēme-ebere, nēbinye kwa madu ihe; Ọ gākwagide okwu-ya nile n'ikpé. 6 N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi agaghi-ewezuga ya n'onọdu-ya: Ihe-ncheta ebighi-ebi ka onye ezi omume gābu. 7 Ọ gaghi-esite n'ihe ọjọ anuworo tu egwu: Edoziwo obi-ya, ebe ọ nātukwasi Jehova obi. 8 Ihe anākwagide ka obi-ya bu, ọ gaghi-atu egwu, Rue mb͕e ọ gēlekwasi ndi nākpab͕u ya anya. 9 Ọ ghasawo àkù-ya, o nyewo ndi-ob͕eye ihe; Ezi omume-ya nēguzo rue mb͕e ebighi-ebi: Agēwere nsọpuru me ka mpi-ya di elu. 10 Onye nēmebi iwu gāhu ya, ewe kpasue ya iwe; Ọ gāta ikekere-ezé, b͕aze kwa: Ọchichọ ndi nēmebi iwu nāchọsi ike gāla n'iyì.

Abù Ọma 113

1 Tonu Ja. Tonu, unu ndi-orù Jehova, Tonu aha Jehova. 2 Ka aha Jehova buru ihe agọziri agọziSite n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi. 3 Site n'ọwuwa anyanwu rue ọdida-yaAha Jehova gābu ihe anēto eto. 4 Jehova di elu n'elu mba nile, N'elu elu-igwe ka ebube-Ya di. 5 Ònye di ka Jehova, bú Chineke-ayi? Nke nēme Onwe-ya ka Ọ di elu inọdu ka eze, 6 Nke nēme Onwe-ya ka Ọ di ala ilekwasiElu-igwe na ilekwasi uwa anya. 7 Ọ bu onye nēme ka onye nēnweghi ike si n'ájá bilie, O nēsi n'ebe ikpofu ahihia bulie ob͕eye elu; 8 Ime ka ya na ndi amara aha nọkọ, Ka ya na ndi amara aha-ha n'etiti ndi-ya nọkọ. 9 Ọ bu onye nēme ka nwayi-àgà nke ulo biri n'ezi-na-ulo nke aka ya, Buru nne nāṅuri ọṅu nke muworo umu-ndikom. Tonu Jehova.

Abù Ọma 114

1 Mb͕e Israel siri n'Ijipt puta, Mb͕e ulo Jekob siri na ndi nātatọ okwu puta; 2 Juda ghọro ebe nsọ Ya, Israel ghọrọ ala Ọ nāchi. 3 Oké osimiri huru ya, we b͕alaga; Jọdan chighariri la azu. 4 Ugwu nile wuliri elu dika ebulu, Ugwu ntà nile wuliri elu dika umu-aturu. 5 Gini nēme gi, oké osimiri, na i nāb͕a ọsọ? Gini nēme gi, Jọdan, na i nēchighari la azu? 6 Gini nēme unu, ugwu, na unu nāwuli elu dika ebulu? Gini nēme unu, ugwu ntà, na unu nāwuli elu dika umu-aturu? 7 Ka o b͕ue gi nb͕u, gi uwa, site n'iru Onye-nwe-ayi, Site n'iru Chineke nke Jekob; 8 Onye b͕anwere oké nkume ka ọ ghọ ọdọ-miri juputara na miri, B͕anwe ọmú ka ọ ghọ isi-iyi miri.

Abù Ọma 115

1 Ọ bughi ayi, Jehova, ọ bughi ayi, Kama ọ bu aha-Gi ka I gēnye nsọpuru, N'ihi ebere-Gi, na n'ihi ezi-okwu-Gi. 2 N'ìhi gini ka mba nile nāsi, Biko, òle ebe Chineke-ha nọ? 3 Ma Chineke-ayi nọ n'elu-igwe: Ihe nile nke tọrọ Ya utọ ka O meworo. 4 Arusi nile ha bu ọla-ọcha na ọla-edo, Ọlu aka madu. 5 Ha nwere ọnu, ma ha adighi-ekwu okwu; Ha nwere anya abua, ma ha adighi-ahu uzọ; 6 Ha nwere nti abua, ma ha adighi-anu ihe; Ha nwere imi, ma ha adighi-anuta ísì; 7 Ha nwere aka-ha abua, ma ha adighi-ebitu ihe; Ha nwere ukwu-ha abua, ma ha adighi-eje ije; Ha adighi-ewere akpiri-ha me uṅara. 8 Ndi nēme ha gādi ka ha: E, onye ọ bula nke nātukwasi ha obi. 9 Israel, tukwasi Jehova obi: Iye-aka-ha na ọta-ha ka Ọ bu. 10 Ulo Eron, tukwasinu Jehova obi: Iye-aka-ha na ọta-ha ka Ọ bu. 11 Unu ndi nātu egwu Jehova, tukwasinu Jehova obi: Iye-aka-ha na ota-ha ka Ọ bu. 12 Jehova echetawo ayi: Ọ gāgọzi ayi: Ọ gāgọzi ulo Israel; Ọ gāgọzi ulo Eron. 13 Ọ gāgọzi ndi nātu egwu Jehova, Ma ndi ntà ma ndi uku. 14 Ka Jehova tukwasiri unu madu, Ka Ọ tukwasiri unu, tukwasi-kwa-ra umu-unu. 15 Ndi agọziri agọzi diri Jehova ka unu bu, Onye meworo elu-igwe na uwa. 16 Elu-igwe bu elu-igwe Jehova nwere; Ma uwa ka O nyeworo umu madu. 17 Ndi nwuru anwu adighi-eto Ja, Ndi nile kwa ndi nārida n'ebe inọ-dū, ha adighi-eto Ya; 18 Ma ayi onwe-ayi gāgọzi JaSite n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi. Tonu Ja.

Abù Ọma 116

1 Ahurum Jehova n'anya, n'ihi na Ọ nānuOlum, bú aririọ-amaram nile. 2 N'ihi na Ọ tọwo nti-Ya n'ala n'ebe m'nọ, Ogologo ubọchi nile nke ndum ka m'ga-akpọku kwa Ya. 3 Udọ̀ nile nke ọnwu b͕aram buruburu, Ebe nile di nkpà nke ala-mọ chọtaram: Ahuhu na iru-újú ka m'nāhu. 4 M'we kpọkue aha Jehova; Si, Biko, Jehova, me ka nkpuru-obim wepuga onwe-ya. 5 Onye-amara na onye ezi omume ka Jehova bu; E, Chineke-ayi nwere obi-ebere. 6 Onye nēdebe ndi nēnweghi uche ka Jehova bu: Enweghm ike, O we nyem nzọputa. 7 Nkpuru-obim, laghachi n'ebe-izu-ike-gi; N'ihi na Jehova emesowo gi nke-ọma. 8 N'ihi na I naputawo nkpuru-obim n'ọnwu, I naputawo kwa anyam abua n'anya-miri, I naputawo kwa ukwum abua na nnuda anēnudam. 9 M'gējeghari n'iru JehovaN'ala nile nke ndi di ndu. 10 Ekwerewom, n'ihi na m'nēkwu okwu: Ewedara mu onwem n'ala nke-uku: 11 Mu onwem siri na nkujamMadu ọ bula bu onye nēkwu okwu-ugha. 12 M'gēsi aṅa nyeghachi JehovaNmeso ọma Ya nile O mesoworom? 13 Iko nke nzọputa nile ka m'gēbuli, Ọ bu kwa aha Jehova ka m'gākpọku. 14 Ka m'kwughachi Jehova nkwa nile m'kwere, Ka m'kwughachi ha n'iru ndi-Ya nile. 15 Ihe di oké ọnu-ahia n'anya JehovaKa ọnwu nke diri ndi-ebere-Ya bu. 16 Ariọm I, Jehova, n'ihi na mu onwem bu orù-Gi: Mu onwem bu orù-Gi, na nwa nke orù-Gi nwayi; I tọpuwo ab͕um nile. 17 Gi ka m'gāchuru aja ekele, Ọ bu kwa aha Jehova ka m'gākpọku. 18 Ka m'kwughachi Jehova nkwa nile m'kwere, Ka m'kwughachi ha n'iru ndi-Ya nile; 19 N'ogige nile nke ulo Jehova, N'etiti gi, Jerusalem. Tonu Ja.

Abù Ọma 117

1 Tonu Jehova, unu mba nile; Janu Ya, unu ndi nile di iche iche. 2 N'ihi na ebere-Ya di ike n'aru ayi; Ọzọ, ezi-okwu nke Jehova nādiru mb͕e ebighi-ebi. Tonu Ja.

Abù Ọma 118

1 Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. 2 Biko, ka Israel si, Na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. 3 Biko, ka ulo Eron si, Na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. 4 Biko, ka ndi nātu egwu Jehova si, Na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. 5 M'siri na nkpàm kpọkue Ja; Ja zaram, me ka m'nọdu n'ebe sara mbara. 6 Jehova dirim; m'gaghi-atu egwu: Gini ka madu gēmem? 7 Jehova dirim n'etiti ndi nēyerem aka: Mu onwem gēlekwasi kwa ndi nākpọm asì. 8 Ọ di nma ib͕abà nime JehovaKari itukwasi madu obi. 9 Ọ di nma ib͕abà nime JehovaKari itukwasi ndi amara aha-ha obi. 10 Mba nile ab͕awom buruburu: N'aha Jehova ka m'gēbipusi ha. 11 Ha ab͕awom buruburu; e, ha ab͕awom buruburu: N'aha Jehova ka m'gēbipusi ha. 12 Ha ab͕awom buruburu dika aṅu; emenyuwo ha dika ọku ogwu: N'aha Jehova ka m'gēbipusi ha. 13 I nudawom enuda ka m'we da: Ma Jehova yerem aka. 14 Ikem na abù ọmam ka Ja bu: Ọ ghọwo-kwa-ram nzọputa. 15 Olu nke iti-nkpu-ọṅù na nzọputa di n'ulo-ikwū nile nke ndi ezi-omume: Aka-nri Jehova nēme ihe dìnkpà. 16 Ebuliwo aka-nri Jehova elu: Aka-nri Jehova nēme ihe dìnkpà. 17 M'gaghi-anwu, kama m'gādi ndu, M'gākọ kwa akukọ ọlu nile nke Ja. 18 Ja adọwom aka na nti nke-uku: Ma ọ bughi n'aka ọnwu ka O nyeworom. 19 Megherenum ọnu-uzọ-ama nile nke ezi omume: M'gābà nime ha, m'gēkele Ja. 20 Nka bu ọnu-uzọ-ama Jehova nwere; Ndi ezi omume gābà nime ya. 21 M'gēkele Gi, n'ihi na I zawom, I we ghọrọm nzọputa. 22 Nkume nke ndi nēwu ulo juruAghọwo isi nkuku ulo. 23 Ọ bu n'aka Jehova ka nka sitere; Nke ahu bu oké ọlu n'anya-ayi. 24 Nka bu ubọchi Jehova meworo; Ayi gētegari egwú ọṅù, ṅuri kwa ọṅu nime ya. 25 Biko, Jehova, zọputa, biko: Biko, Jehova, me ka ihe nāgara ayi nke-ọma, biko. 26 Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n'aha Jehova: Ayi esiwo n'ulo Jehova gọzie unu. 27 Chineke ka Jehova bu, Ọ nyewo kwa ayi ìhè: Chiri udọ̀ ke àjà-ememe, durue ya na mpi nile nke ebe-ichu-àjà. 28 Chinekem ka I bu, m'gēkele kwa Gi: Chinekem ka I bu, m'gēbuli Gi elu. 29 Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

Abù Ọma 119

1 Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi zuru okè n'uzọ Jehova bu, Ndi nējeghari n'iwu jehova. 2 Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nēchebe ihe-àmà-Ya nile bu, Ndi nēwere obi-ha nile chọ Ya. 3 E, ha emeghi ajọ omume; N'uzọ-Ya nile ka ha nēje ije. 4 Gi onwe-gi ewerewo ihe-iriba-ama-Gi nye ayi n'iwu, Ka ayi we debesie ha ike. 5 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na edoziwo uzọm nile Idebe ukpuru-Gi nile! 6 Mb͕e ahu ihere agaghi-emem, Mb͕e m'nēlegide anya n'ebe ihe nile I nyere n'iwu di. 7 M'gēwere obi ziri ezi kele Gi, Mb͕e m'mutara ikpé nile nke ezí omume-Gi. 8 Ukpuru-Gi nile ka m'gēdebe: Arapusilam arapu. 9 Gini ka okorọbia gēji me ka uzọ-ya di ọcha? Ọ bu n'ilezi ya anya dika okwu-Gi si di. 10 Obim nile ka m'wereworo chọ Gi: Ekwela ka m'si n'ihe nile I nyere n'iwu jehie. 11 N'obim ka m'zobeworo okwu-ọnu-Gi, Ka m'we ghara imehie megide Gi. 12 Onye agọziri agọzi ka I bu, Jehova: Zím ukpuru-Gi nile. 13 Eb͕ub͕ere-ọnum ka m'wereworo kọ akukọ Ikpé nile nke ọnu-Gi. 14 N'uzọ ihe-àmà-Gi nile ka obi nātọm utọ, Dika ọ gātọm utọ bayere àkù nile. 15 N'ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'gātughari uche, M'gēlegide kwa uzọ-Gi nile anya. 16 Ihe ukpuru-Gi nile gātọm utọ nke-uku: M'gaghi-echezọ okwu-Gi. 17 Meso orù-Gi nke-ọma, ka m'we di ndu; M'gēdebe kwa okwu-Gi. 18 Kpughepu anyam abua, ka m'we legide Oké ihe di iche iche si n'iwu-Gi puta. 19 Ọbìa ka m'bu n'uwa: Ezonarilam ihe nile I nyere n'iwu. 20 Nkpuru-obim etiwawo n'ihi ọchichọ O ji chọsie ikpé-Gi nile ike mb͕e nile. 21 I basiworo ndi-nganga ndi abuworo ọnu nba ike, Ndi nēsi n'ihe nile I nyere n'iwu jehie. 22 Wepu ita-uta na nleda n'arum; N'ihi na echebewom ihe-àmà-Gi nile. 23 Ọzọ, ndi-isi nọduru ala kwurita okwu imegidem: Ma orù-Gi nātughari uche n'ukpuru-Gi nile. 24 Ọzọ, ihe-àmà-Gi nile bu ihe nātọm utọ nke-uku, Ha bu ndi nādum ọdu. 25 Nkpuru-obim nārapara n'ájá: Dika okwu-Gi si di, me ka m'di ndu. 26 Akọrọm akukọ uzọm nile, I we zam: Gi zím ukpuru-Gi nile. 27 Me ka m'ghọta uzọ nke ihe-iriba-ama-Gi nile: M'gātughari kwa uche n'oké ọlu-Gi nile. 28 Nkpuru-obim atupuwo dika miri site n'iru-újú: Dika okwu-Gi si di, me ka m'guzosie ike. 29 Wezuga uzọ okwu-ugha n'ebe m'nọ: Were kwa amara nyem iwu-Gi. 30 Uzọ nke ikwesi-ntukwasi-obi ka m'rọputaworo: Ikpé-Gi nile ka m'doworo n'irum. 31 Araparawom n'aru ihe-àmà-Gi nile: Jehova, emela ka ihere mem. 32 N'uzọ nke ihe nile I nyere n'iwu ka m'gāb͕a ọsọ, N'ihi na I gēme ka obim sa mbara. 33 Jehova, zím uzọ ukpuru-Gi nile: M'gēchebe kwa ya rue mb͕e ikpe-azu. 34 Me ka m'ghọta ihe, m'gēchebe kwa iwu-Gi; M'gēwere kwa obim nile debe ya. 35 Me ka m'zọ ije n'okporo-uzọ nke ihe nile I nyere n'iwu; N'ihi na uzọ ahu nātọm utọ 36 Wezuga obim iche ihe-àmà-Gi nile iru, Ewezuga-kwa-la ya iche urù nēzighi ezi iru. 37 Me ka anyam abua si n'ile ihe-efu gabiga, Me ka m'di ndu n'uzọ-Gi nile. 38 Me ka okwu-ọnu-Gi guzosiere orù-Gi ike, Bú nke diri egwu-Gi. 39 Me ka ita-utam nke m'nātu ujọ ya gabiga; N'ihi na ikpé-Gi nile di nma. 40 Le, achọsiwom ihe-iriba-ama-Gi nile ike: N'ezi omume-Gi me ka m'di ndu. 41 Ọzọ, kwe ka ebere-Gi nile biakutem, Jehova, Bú nzọputa-Gi, dika okwu-ọnu-Gi si di. 42 M'gāza kwa onye nātam uta okwu; N'ihi na atukwasiwom okwu-Gi obi. 43 Anapusi-kwa-la okwu nke ezi-okwu n'ọnum; N'ihi na ikpé-Gi nile ka m'chereworo. 44 M'gēdebe kwa iwu-Gi mb͕e nile Rue mb͕e nile ebighi-ebi. 45 M'gējeghari kwa n'ebe sara mbara; N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'chọworo. 46 M'gēkwu kwa okwu bayere ihe-àmà-Gi nile n'iru ndi-eze, Ihere agaghi-emekwam. 47 Ihe nke ihe nile I nyere n'iwu gātọkwam utọ nke-uku, Bú nke m'huworo n'anya. 48 M'gāchili-kwa-ra ihe nile I nyere n'iwu ọbu-akam, bú ihe nke m'huworo n'anya; M'gātughari kwa uche n'ukpuru-Gi nile. 49 Cheta okwu I gwara orù-Gi, Nke I meworom ka m'chere. 50 Nka bu nkasi-obim nime nweda-n'alam: Na okwu-ọnu-Gi emewo ka m'di ndu. 51 Ndi-nganga akwawom emò nke-uku: Ma esighm n'iwu-Gi wezuga onwem. 52 Echetawom ikpé-Gi nile site na mb͕e ebighi-ebi, jehova, We kasie onwem obi. 53 Iwe di ọku ejidewom, N'ihi ndi nēmebi iwu ndi nārapu iwu-Gi. 54 Abù ọma ka ukpuru-Gi nile buruworom N'ulo ebe m'nọ dika ọbìa. 55 Echetawom aha-Gi, Jehova, n'abali, We debe iwu-Gi. 56 Nka ka m'nweworo, Na echebewom ihe-iriba-ama-Gi nile. 57 Òkèm ka Jehova bu: Asiwom na m'gēdebe okwu-Gi nile. 58 Ewerewom obim nile me ka iru-Gi dajua: Merem amara dika okwu-ọnu-Gi si di. 59 Echèrem èchìchè uzọm nile, We me ka ukwum abua laghachi n'ihe-àmà-Gi nile. 60 Abiaram ọsọsọ, ọ b͕agwojughkwam anya, Idebe ihe nile I nyere n'iwu. 61 Udọ̀ nile nke ndi nēmebi iwu ehikọwom buruburu; Ma echezọghm iwu-Gi. 62 N'etiti abali ka m'gēbili ikele Gi N'ihi ikpé nile nke ezi omume-gi. 63 Onye ekekọtaworo mu na ndi nile nātu egwu Gi n'otù ka m'bu, Onye ekekọtaworo mu na ndi nēdebe ihe-iriba-ama-Gi nile n'otù. 64 Jehova, uwa juputara n'ebere-Gi: Zím ukpuru-Gi nile. 65 I meworo orù-Gi ezi ihe, Jehova, dika okwu-Gi si di. 66 Zím idi-nma nke ezi uche na ihe-ọmuma; N'ihi na ọ bu n'ihe nile I nyere n'iwu ka m'kwereworo. 67 Tutu ewedam n'ala mu onwem nēme ihe ọjọ n'amaghi-ama; Ma ub͕u a okwu-ọnu-Gi ka m'debeworo. 68 Onye di nma ka I bu, na Onye nēme nma; Zím ukpuru-Gi nile. 69 Ndi-nganga etekpuwom okwu-ugha dika ihe-ntekpu: Mu onwem gēwere obim nile chebe ihe-iriba-ama-Gi nile. 70 Obi-ha bu nání abuba dika abuba; Ma mu onwem, ihe iwu-Gi nātọm utọ nke-uku. 71 Ọ dim nma na ewedawom n'ala; Ka m'we muta ukpuru-Gi nile. 72 Iwu ọnu-Gi dim nma Kari ọla-edo na ọla-ọcha nādighi iguta-ọnu. 73 Aka-Gi abua emewom, me kwa ka m'guzosie ike: Gi me ka m'ghọta ihe, ka m'we muta ihe nile I nyere n'iwu. 74 Ndi nātu egwu Gi gāhum, we ṅuria; N'ihi na okwu-Gi ka m'chereworo. 75 Jehova, amawom na ikpé-Gi nile bu ezi omume, Amawokwam na ọ bu n'ikwesi-ntukwasi-obi ka I wedaworom nala. 76 Biko, kwe ka ebere-Gi buru ihe gākasi obim, Dika okwu-ọnu-Gi nke diri orù-Gi si di. 77 Ka obi-ebere-Gi nile biakutem, ka m'we di ndu; N'ihi na iwu-Gi bu ihe nātọm utọ nke-uku. 78 Ka ihere me ndi-nganga; n'ihi na ha ewerewo okwu-ugha me ka ikpém b͕agọ ab͕agọ: Ma m'gātughari uche n'ihe-iriba-ama-Gi nile. 79 Ka ndi nātu egwu Gi laghachikutem, Ha gāma kwa ihe-àmà-Gi nile. 80 Ka obim zue okè n'ukpuru-Gi nile, Ka ihere we ghara imem. 81 Nkpuru-obim agwusiwo site n'ichọsi nzọputa-Gi ike: Ma okwu-Gi ka m'chereworo. 82 Anyam abua adalawo n'isi site n'ichọsi okwu-Gi ike, Mb͕e m'nāsi, Òle mb͕e I gākasim obi? 83 N'ihi na adiwom ka karama-akpukpọ di n'anwuru-ọku; Ma echezọghm ukpuru-Gi nile. 84 Ùbọchi nke orù-Gi di ole? Òle mb͕e I gēme ndi nēsob͕um ihe I kpere n'ikpe? 85 Ndi-nganga egwuworom olùlù di iche iche, Bú ndi nādighi ka iwu-Gi si di. 86 Ihe nile I nyere n'iwu kwesiri ntukwasi-obi: N'uzọ okwu-ugha ka ha nēsob͕um; biko, yerem aka. 87 Ọ fọduru nwantī ka ha me ka m'gwusia n'uwa; Ma mu onwem arapughi ihe-iriba-ama-Gi nile. 88 Dika ebere-Gi si di, me ka m'di ndu, M'gēdebe kwa ihe-àmà nke ọnu-Gi. 89 Jehova, rue mb͕e ebighi-ebi Ka emeworo ka okwu-Gi guzosie ike n'elu-igwe. 90 Rue ọb͕ọ nile ka ikwesi-ntukwasi-obi-Gi di: I mewo ka uwa guzosie ike, o we guzo. 91 Dika ikpé-Gi nile si di, ha nēguzo ta; N'ihi na ihe nile bu ndi-orù-Gi. 92 Asi na iwu-Gi abughi ihe nātọm utọ nke-uku, Mb͕e ahu m'gālawori n'iyì nime nweda-n'alam. 93 Rue mb͕e ebighi-ebi m'gaghi-echezọ ihe-iriba-ama-Gi nile: N'ihi na ha ka I jiworo me ka m'di ndu. 94 Ọ bu Gi nwem, zọputam; N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'chọworo. 95 Ndi nēmebi iwu elewo anyam ime ka m'la n'iyì; Ma ihe-àmà-Gi nile ka m'gātukwasi uche. 96 Ahuwom nsọtu diri izu-okè nile; Ma ihe, I nyere n'iwu sara mbara nke-uku. 97 Le ka m'si hu iwu-Gi n'anya! Ogologo ubọchi nile ka nke ahu bu ihe m'natughari n'uche. 98 Ihe nile I nyere n'iwu nēme ka m'mara ihe kari ndi-irom; N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka nke ahu dirim. 99 Kari ndi nile nēzím ihe ka m'nwere uche; N'ihi na ihe-àmà-Gi nile bu ihe m'nātughari n'uche. 100 Anamaghọta ihe kari ndi-okenye, N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'chebeworo. 101 Eb͕ochiwom ukwum abua ka ha ghara ibà n'uzọ ọjọ ọ bula, Ka m'we debe okwu-Gi. 102 Esighm n'ikpé-Gi nile wezuga onwem; N'ihi na I zíwom ihe. 103 Le ka okwu-ọnu-Gi si atọ okpo-ọnum utọ! Ha nātọ ọnum utọ kari manu-aṅu. 104 M'nēsitei n'ihe-iriba-ama-Gi nile ghọta ihe: N'ihi nka ka m'kpọworo uzọ okwu-ugha ọ bula asì. 105 Okwu-Gi bu oriọna diri ukwum, Ọ bu kwa ìhè diri okporo-uzọm. 106 Aṅuwom iyi, me ka o guzosie ike, Na m'gēdebe ikpé nile nke ezi omume-Gi. 107 Ewedawom n'ala nke-uku: Me ka m'di ndu, Jehova, dika okwu-Gi si di. 108 Biko, ka onyinye-afọ-ofufo nile nke ọnum tọ Gi utọ, Jehova, Zíkwam ikpé-Gi nile. 109 Nkpuru-obim di n'ọbu-akam mb͕e nile; Ma echezọghm iwu-Gi. 110 Ndi nēmebi iwu esiworom ọnya; Ma esighm nihe-iriba-ama-Gi nile fugharia. 111 Eketawom ihe-àmà-Gi nile rue mb͕e ebighi-ebi; N'ihi na ihe nātọ obim utọ ka ha bu. 112 Ewezugawom obim ime ukpuru-Gi nile, Rue mb͕e ebighi-ebi, rue mb͕e ikpe-azu. 113 Ndi nwere uche abua ka m'kpọworo asì: Ma iwu-Gi ka m'huworo n'anya. 114 Ebe-nzuzom na ọtam ka I bu: Okwu-Gi ka m'chereworo. 115 Sinu n'ebe m'nọ wezuga onwe-unu, unu ndi nēme ihe ọjọ; Ka m'we chebe ihe nile Chinekem nyere n'iwu. 116 Kwagidem dika okwu-ọnu-Gi si di, ka m'we di ndu; Eme-kwa-la ka ihere olile-anyam mem. 117 Kwaliem elu, ewe zọputam, M'gēle kwa ukpuru-Gi nile anya ọma mb͕e nile. 118 I ledawo ndi nile si n'ukpuru nile Gi jehie anya, N'ihi na okwu-ugha ka aghughọ-ha bu. 119 I nēme ka ndi nile nēmebi iwu n'uwa gwusia di ka ifuru: N'ihi ya ka m'huworo ihe-àmà-Gi nile n'anya. 120 Aji anu-arum guzoro ọtọ site n'oké egwu-Gi; Ọ bu kwa ikpé-Gi nile ka m'nātu egwu ha. 121 Emewom ikpe ekpere na ezi omume: Arapulam nye ndi nēmeb͕um. 122 Buru onye-mbe nye orù-Gi na I gēmem nma: Ekwela ka ndi-nganga meb͕uem. 123 Anyam abua adalawo n'isi n'ichọsi nzọputa-Gi ike, Na n'ichọsi okwu ezi omume-Gi ike. 124 Meso orù-Gi dika ebere-Gi si di, Zíkwam ukpuru-Gi nile 125 Orù-Gi ka m'bu, me ka m'ghọta ihe, Ka m'we mara ihe-àmà-Gi nile. 126 Mb͕e eruworo Jehova ilu ọlu; Ha emebiwo iwu-Gi. 127 N'ihi nka ka m'huworo ihe nile I nyere n'iwu n'anya Kari ọla-edo, e, kari ọla-edo anuchara anucha. 128 N'ihi nka ka m'guworo ihe-iriba-ama-Gi nile, nke diri ihe nile, n'ihe ziri ezi; Uzọ okwu-ugha ọ bula ka m'kpọworo asì. 129 Oké ọlu ka ihe-àmà-Gi nile bu: N'ihi nka ka nkpuru-obim chebeworo ha. 130 Nkpughepu okwu-Gi nile nēnye ìhè; Ọ nēmeka ndi nēnweghi uche ghọta ihe. 131 Asaghepurum ọnum, ku kwa ume ike ike; N'ihi na achọsirim ihe nile I nyere n'iwu ike. 132 Chem iru, me-kwa-ram amara, Dika I si eme ndi nāhu aha-Gi n'anya. 133 Me ka nzọ-ukwum nile guzosie ike n'okwu-ọnu-gi: Ekwe-kwa-la ka ajọ ihe ọ bula buru onye-isim. 134 B͕aputam na nmeb͕u nke madu: M'gēdebe kwa ihe-iriba-ama-Gi nile. 135 Me ka iru-Gi nye orù-Gi ìhè; Zíkwam ukpuru-Gi nile. 136 Anya-miri nke di ka ọtutu miri-iyi nāb͕a anyam abua, N'ihi na ha edebeghi iwu-Gi. 137 Onye ezi omume ka I bu Jehova, Ọzọ, ihe ziri ezi ka ikpé-Gi nile bu. 138 I nyewo ihe-àmà-Gi nile iwu n'ezi omume Na ikwesi-ntukwasi-obi di uku. 139 Ekworom ekpochapuwom, N'ihi na ndi nākpab͕um echezọwo okwu-Gi nile. 140 Ihe anuchara anucha nke-uku ka okwu-ọnu-Gi bu; Orù-Gi ahuwo kwa ya n'anya. 141 Onye ntà ka m'bu, na onye anēleda anya: Ma echezọghm ihe-iriba-ama-Gi nile. 142 Ezi omume-Gi bu ezi omume nādiru mb͕e ebighi-ebi, Iwu-Gi bu kwa ezi-okwu 143 Ahuhu na nkpà achọtawom: Ma ihe nile I nyere n'iwu bu ihe nātọm utọ nke-uku. 144 Ihe-àmà-Gi nile bu ezi omume rue mb͕e ebighi-ebi: Me ka m'ghọta ihe, m'gādi kwa ndu. 145 Ewerewom obim nile kpọ nkpu; zam, Jehova: Ukpuru-Gi nile ka m'gēchebe. 146 Akpọkuwom I; zọputam, M'gēdebe kwa ihe-àmà-Gi nile. 147 Eburum chi-ọbubọ uzọ, we tikue Gi: Okwu-Gi nile ka m'chere. 148 Anyam abua buru nche-abali nile uzọ, Ka m'we tugharia uche n'okwu-ọnu-Gi. 149 Nuru olum, dika ebere-Gi si di: Dika ikpé-Gi nile si di, Jehova, me ka m'di ndu. 150 Ha abiaruwo nso bú ndi nāb͕aso nzube ọjọ; Ha nọ iwu-Gi n'ebe di anya. 151 Gi onwe-gi nọ nso, Jehova; Ọzọ, ihe nile I nyere n'iwu bu ezi-okwu. 152 Site na mb͕e ochie ka m'maworo site n'ihe-àmà-Gi nile, Na rue mb͕e ebighi-ebi ka I tọworo ntọ-ala-ha. 153 Hu nweda-n'alam, dọputam; N'ihi na echezọghm iwu-Gi. 154 Kpe ọnum b͕aputakwam: Dika okwu-ọnu-Gi si di, me ka m'di ndu. 155 Nzọputa di anya n'ebe ndi nēmebi iwu nọ; N'ihi na ha achọghi ukpuru-Gi nile. 156 Obi-ebere-Gi nile bara uba, Jehova; Dika ikpé-Gi nile si di, me ka m'di ndu. 157 Ha di ọtutu, bú ndi nēsob͕um na ndi nākpab͕um; Ma esighm n'ihe-àmà-Gi nile wezuga onwem. 158 Ahurum ndi nāghọb͕u nghọb͕u, m'we sọ ha oyi; N'ihi na ha edebeghi okwu-ọnu-Gi. 159 Le otú m'huworo ihe-iriba-ama-Gi nile n'anya: Dika ebere-Gi si di, Jehova, me ka m'di ndu. 160 Isi ihe nke okwu-Gi bu ezi-okwu; Ọzọ, rue mb͕e ebighi-ebi ka ikpé ọ bula nke ezi omume-Gi di. 161 Ndi-isi esob͕uwom n'efu; Ma okwu-Gi nile ka obim tuworo oké egwu ha. 162 Obi nātọ mu onwem utọ n'ihi okwu-ọnu-Gi, Dika onye nāhuta ọtutu ihe-nkwata. 163 Okwu-ugha ka m'kpọworo asì, m'we kpọ ya ihe-árú; Ma iwu-Gi ka m'huworo n'anya. 164 Ub͕ò asa n'ubọchi ka m'toworo Gi, N'ihi ikpé nile nke ezi omume-Gi. 165 Udo nke riri nne ka ndi nāhu iwu-Gi n'anya nwere; Ọ dighi kwa ihe-isu-ngọngọ ha nwere. 166 Elewom anya nzọputa-Gi, Jehova, Ọ bu kwa ihe nile I nyere n'iwu ka m'meworo. 167 Nkpuru-obim edebewo ihe-àmà-Gi nile; Anamahu kwa ha n'anya nke-uku. 168 Edebewom ihe-iriba-ama-Gi nile na ihe-àmà-Gi nile; N'ihi na uzọm nile di n'iru Gi. 169 Ka iti-nkpum biarue nso n'iru Gi, Jehova: Dika okwu-Gi si di, me ka m'ghọta ihe. 170 Ka aririọ-amaram bia n'iru Gi: Dika okwu-ọnu-Gi si di, naputam. 171 Ka eb͕ub͕ere-ọnum kwuwa otuto; N'ihi na I nezím ukpuru-Gi nile. 172 Ka irem bùa abù bayere okwu-ọnu-Gi; N'ihi na ihe nile I nyere n'iwu bu ezi omume. 173 Ka aka-Gi buru ihe iyerem aka; N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'rọputaworo. 174 Achọsiwom nzọputa-Gi ike, Jehova; Iwu-Gi bu kwa ihe nātọm utọ nke-uku. 175 Ka nkpuru-obim di ndu, ọ gēto kwa Gi; Ka ikpé-Gi nile ye-kwa-ram aka. 176 Efughariwom dika aturu nke furu efu; chọ orù-Gi; N'ihi na echezọghm ihe nile I nyere n'iwu.

Abù Ọma 120

1 Jehova ka m'kpọkuru n'ahuhu dirim, O we zam. 2 Jehova, naputa nkpuru-obim n'eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha, Na n'ire aghughọ. 3 Gini ka agēnye gi, ọ̀ bu kwa gini ka agātukwasiri gi, Gi ire aghughọ? 4 Àkú di nkọ nke dike, Ha na icheku-ọku nke osisi broom. 5 Ahuhu dirim, na anọm dika ọbìa nime Meshek, Na ebim n'akuku ulo-ikwū nile nke Kida! 6 Ogologo mb͕e di anya ka nkpuru-obim biriworoN'akuku onye nākpọ udo asì. 7 Mu onwem bu onye-udo: Ma mb͕e m'nēkwu okwu, ndi ahu nāchọ ibu agha.

Abù Ọma 121

1 M'gēweli anyam abua le ugwu nile: Òle ebe iye-akam gēsi bia? 2 Iye-akam nēsi n'aka Jehova bia, Onye meworo elu-igwe na uwa. 3 Ya ekwela ka ewezuga ukwu-gi n'ọnọdu-ya: Onye nēdebe gi, Ya atula òrù-ura. 4 Le, Ọ dighi-atu òrù-ura, Ọ dighi-araru kwa ura, Bú Onye nēdebe Israel. 5 Jehova bu Onye nēdebe gi: Jehova bu ǹdò-gi n'aka-nri-gi. 6 Anyanwu agaghi-etib͕u gi n'ehihie, Ọnwa agaghi-etib͕u kwa gi n'abali. 7 Jehova gēdebe gi ka ihe ọjọ ọ bula ghara idakwasi gi; Ọ gēdebe nkpuru-obi-gi. 8 Jehova gēdebe ọpupu-gi na nbata-gi, Site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi.

Abù Ọma 122

1 Aṅuririm ọṅu mb͕e ha nāsim, Ka ayi je n'ulo Jehova. 2 Ukwu-ayi eguzowoN'ọnu-uzọ-ama-gi nile, Jerusalem; 3 Jerusalem, nke ewuworoDika obodo nke ejikọtara n'otù nke-ọma: 4 Ebe ebo nile rigoworo, bú ebo nile nke Ja, Iburu Israel ihe-àmà, Ikele aha Jehova. 5 N'ihi na n'ebe ahu ka edoworo oche-eze nile ikpe ikpe, Bú oche-eze nile ulo Devid nwere. 6 Riọnu aririọ bayere udo Jerusalem: Ndi nāhu gi n'anya gānọ n'udo. 7 Ka udo di n'ékpè-gi nile, Ka inọ-n'udo di kwa n'ulo-gi nile di elu. 8 N'ihi umu-nnem na ndi-eyìm, Biko, ka m'kwue okwu, si, Ka udo di nime gi. 9 N'ihi ulo Jehova, bú Chineke-ayi, M'gāchọrọ gi ọdi-nma.

Abù Ọma 123

1 Gi ka m'gēweli anyam abua le, Gi Onye nānọdu ala n'elu-igwe. 2 Le, dika anya ndi-orù si elekwasi aka ndi-nwe-ha, Dika anya abua nke nwayi nēje ozi si elekwasi aka nwayi nwere ike n'aru ya; Otú a ka anya-ayi nēlekwasi Jehova, bú Chineke-ayi, Rue mb͕e Ọ gēmere ayi amara. 3 Mere ayi amara, Jehova, mere ayi amara: N'ihi na nleda ejuwo ayi afọ ri nne. 4 Afọ ejuwo nkpuru-obi-ayi ri nneN'ichì-ọchì nke ndi nọ jū, Na nleda nke ndi-npako.

Abù Ọma 124

1 Asi na ọ bughi Jehova Nke diri ayi, Biko, ka Israel kwue otú a, si; 2 Asi na ọ bughi jehova Nke diri ayi, Mb͕e madu biliri imegide ayi: 3 Mb͕e ahu ha gēlowori ayi na ndu, Mb͕e iwe-ha di ọku n'aru ayi: 4 Mb͕e ahu miri gēruchapuwori ayi, Miri-iyi gāgabigawori n'elu nkpuru-obi-ayi. 5 Mb͕e ahu miri di nganga gāgabigawori n'elu nkpuru-obi-ayi. 6 Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, Onye nēnyeghi ayi iburu ezé-ha anu-ndọb͕u. 7 Nkpuru-obi-ayi ewepugawo onwe-ya dika nnunu n'ib͕udu ndi-osi-ọnyà: Ib͕udu ahu kpajiri akpaji, ayi onwe-ayi we wepuga onwe-ayi. 8 Iye-aka-ayi di n'aha Jehova, Onye meworo elu-igwe na uwa.

Abù Ọma 125

1 Ndi nātukwasi Jehova obiDika ugwu Zaion, nke anādighi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya, kama rue mb͕e ebighi-ebi ka ọ nādigide. 2 Jerusalem, ugwu-ya nile di ya buruburu: Otú a ka Jehova di ndi-Ya buruburu. Site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi. 3 N'ihi na nkpa-n'aka-eze nke nmebi-iwu agaghi-adigide n'elu ihe ruru ndi ezi omume n'ife-nzà; Ka ndi ezi omume we ghara isetipu aka-ha tiye n'ajọ omume. 4 Jehova, me ndi di nma nma, Me kwa ndi ziri ezi n'obi-ha nma. 5 Ma ndi nēwezuga onwe-ha ije n'uzọ nile ha b͕agọro ab͕agọ, Jehova gēme ka ha na ndi nālu ajọ ihe yikọ la. Ka udo dikwasi Israel.

Abù Ọma 126

1 Mb͕e Jehova mere ka ndi nālata na Zaion lata, Ayi di ka ndi nārọ nrọ. 2 Mb͕e ahu ọchì nēju ayi ọnu, Iti-nkpu-ọṅù nēju kwa ayi ire: Mb͕e ahu ha nāsi n'etiti mba nile, Jehova emeworo ndia ihe uku. 3 Jehova emeworo ayi ihe uku; Ayi nāṅuri ọṅu. 4 Jehova, me ka ndi-ayi adọtara n'agha lata, Dika miri-iyi di iche iche nime Negeb. 5 Ndi ji anya-miri agha nkpuru gēji iti-nkpu-ọṅù we ihe-ubi. 6 Onye nēbu nju-aka nkpuru-ọghigha, ọ bu ezie na ọ nēje ije nākwa ákwá; Ma ọ ghaghi iwere iti-nkpu-ọṅù biaghachi, nēbu ùkwù-ọka-ya nile.

Abù Ọma 127

1 Ọ buru na Jehova ewughi ulo, N'efu ka ha dọb͕uworo onwe-ha n'ọlu nime ya, bú ndi nēwu ya: Ọ buru na Jehova echeghi obodo, N'efu ka onye-nche muruworo anya. 2 Ọ buru unu ihe-efu, unu ndi nēbili n'isi-ututu, ndi nāla azu n'inọdu ala, Ndi nēri nri nke ihe-nb͕u di iche iche: Otú a ka Ọ nēnye ndi Ọ huru n'anya ura. 3 Le, ihe-nketa nke nēsi n'aka Jehova bia ka umu bu: Ugwọ-ọlu Ọ nākwu ka nkpuru nke afọ bu. 4 Dika àkú n'aka dike, Otú a ka umu amuru na mb͕e okorọbia di. 5 Onye ihe nāgara nke-ọma ka nwoke ahu bu nke chiriworo àkú ahu kpojue àkpà-àkú-ya: Ihere agaghi-eme ha, Mb͕e ha na ndi-iro-ha nēkwurita okwu n'ọnu-uzọ-ama.

Abù Ọma 128

1 Onye ihe nāgara nke-ọma ka onye ọ bula nke nātu egwu Jehova bu, Nke nēje ije n'uzọ-Ya nile. 2 N'ihi na ihe i chiri ọbu-aka-gi dọb͕u onwe-gi n'ọlu inwe ka i gēri: Onye ihe nāgara nke-ọma ka i bu, ọ gādi-kwa-ra gi nma. 3 Nwunye-gi gādi ka osisi vine nāmi nkpuru n'ime-ime-ulo nke ulo-gi: Umu-gi gādi ka ome osisi oluve buruburu table-gi. 4 Le, na otú a ka agāgọzi nwoke ahuNke nātu egwu Jehova. 5 Jehova gēsi na Zaion gọzie gi: Gi lekwasi kwa ọdi-nma Jerusalem anya ubọchi nile nke ndu-gi, 6 Hu kwa umu nke umu-gi gāmu. Ka udo dikwasi Israel.

Abù Ọma 129

1 Ọtutu mb͕e ka ha kpab͕uworom site na mb͕e m'di na nwata, Biko, ka Israel kwue otú a, si, 2 Ọtutu mb͕e ka ha kpab͕uworom site na mb͕e m'di na nwata: Ma otú ọ di, ha apughi imegidem. 3 N'elu azum ka ndi-plough jiri plough gwu dika esi egwu ala-ubi; Ha mere ka furrow nile ha di ogologo. 4 Jehova bu onye ezi omume: O bipuwo udọ̀ nile nke ndi nēmebi iwu. 5 Ka ihere me ha, ka ha laghachi kwa azu, Bú ndi nile nākpọ Zaion asì. 6 Ka ha di ka ahihia nēpú n'elu ulo, Nke nākpọnwu mgbe o puputara: 7 Nke onye nēwe ihe-ubi nējighi kpojue ọbu-aka-ya, Onye nēhie ùkwù-ọka nējighi kwa ya kpojue obi-ya. 8 Ọzọ, ndi nāgabiga asighi, Ka ngọzi Jehova diri unu; Ayi agọziwo unu n'aha Jehova.

Abù Ọma 130

1 N'ob͕u-miri nile ka m'siworo kpọkue Gi, Jehova. 2 Onye-nwem, ge nti olum: Ka nti-Gi nāṅa kwa ntiN'olu nke aririọ-amaram nile. 3 Ọ buru na I riba ajọ omume nile ama, Ja, Onye-nwe-ayi, ònye gēguzo? 4 Ma n'aka-Gi ka nb͕aghara di, Ka ewe tua egwu Gi. 5 Elewom anya Jehova, nkpuru-obim elewo anya, Ọ bu kwa okwu-Ya ka m'chereworo. 6 Nkpuru-obim nēchere Jehova, Karia ka ndi-nche si echere ututu; E, karia ka ndi-nche si echere ututu. 7 Israel, chere Jehova: N'ihi na n'aka Jehova ka ebere di, Nb͕aputa riri nne di kwa n'aka-Ya. 8 Ya onwe-ya gāb͕aputa kwa IsraelN'ajọ omume-ya nile.

Abù Ọma 131

1 Jehova, nkpuru-obim adighi elu, anyam abua ebulighi kwa onwe-ha elu; Ejegharighkwam n'ihe uku di iche iche, Ma-ọbu n'oké ọlu di iche iche karirim. 2 N'ezie edoziwom nkpuru-obim me ka ọ dere du; Dika nwata nke emere ka ọ rapu ara si di n'aru nne-ya, Dika nwata nke emere ka ọ rapu ara, otú a ka nkpuru-obim di n'arum. 3 Israel, chere JehovaSite n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi.

Abù Ọma 132

1 Jehova, chetara DevidNweda-n'ala-ya nile. 2 Otú ọ ṅuru Jehova iyi, Kwe Dike nke Jekob nkwa: 3 N'ezie m'gaghi-abà n'ulo-ikwū nke ulom, M'gaghi-arigo n'elu ihe-ndina nke utem; 4 M'gaghi-enye anyam abua ura, M'gaghi-enye mbubere-anyam irù-ura; 5 Rue mb͕e m'gāchọtara Jehova ọnọdu, Chọtara Dike nke Jekob ebe-obibi. 6 Le, ayi nuru okwu bayere ya n'Efrata: Ayi chọtara ya n'ọhia nke oké ọhia. 7 Ka ayi ba n'ebe-obibi-Ya nile; Ka ayi kpọ isi ala n'ebe ihe-nb͕akwasi-ukwu-Ya di. 8 Bilie, Jehova, ba n'ebe-izu-ike-Gi; Gi onwe-gi, na ib͕e nke ike-Gi. 9 Ka ndi-nchu-àjà-Gi yiri ezi omume dika uwe; Ka ndi-ebere-Gi tikwa nkpu ọnu. 10 N'ihi Devid, bú orù-Gi, Atugharila iru onye-Gi etere manu. 11 Jehova aṅuworo Devid iyi bu ezi-okwu; Ọ gaghi-esi na ya laghachi azu: Ndi sitere na nkpuru nke afọ-gi ka M'gādọkwasi n'oche-eze i nwere. 12 Ọ buru na umu-gi edebe ọb͕ub͕a-ndumNa ihe-àmàm nke M'gēzí ha, Umu-ha gānọkwasi kwa n'oche-eze i nwere rue mb͕e nile ebighi-ebi. 13 N'ihi na Jehova arọputawo Zaion; Ọ chọsiwo ya ike iburu Ya ebe-obibi. 14 Nka bu ebe-izu-ikem rue mb͕e nile ebighi-ebi: N'ebe a ka M'gēbi; n'ihi na achọsiwom ya ike. 15 Ihe-oriri-ya ka M'gāgọzi nke-uku: Ndi-ob͕eye-ya bu ndi M'gēji nri me ka afọ ju ha. 16 Ọ bu kwa ndi-nchu-àjà-ya ka M'gēyikwasi nzọputa dika uwe: Ndi-ebere-ya gētisi kwa nkpu ọṅù ike. 17 N'ebe ahu ka M'gēme ka mpi Devid nwere pue: Edoworom onye nkem etere manu oriọna n'usoro. 18 Ndi-iro-ya ka M'gēyikwasi ihere dika uwe: Ma n'isi-ya ka okpu-eze-ya gāb͕awa okoko.

Abù Ọma 133

1 Le, ka o si di nma, ka o si di kwa utọ nke-uku, Bú nbikọ nke umu-nne, ọbuná ibikọ n'otù! 2 Ọ di ka ezi manu ahu nke dikwasi n'isi, Nke nērùda n'afu-ọnu, Bú afu-ọnu Eron; Nke nēruda n'ọnu uwe-nwuda-ya nile; 3 Dika igirigi Heamon, Nke nādakwasi n'ugwu nile nke Zaion: N'ihi na n'ebe ahu ka Jehova nyere ngọzi ahu iwu, Bú ndu rue mb͕e ebighi-ebi.

Abù Ọma 134

1 Le, gọzienu Jehova, unu ndi-orù nile nke Jehova, Ndi nēguzo n'ulo Jehova n'abali nile. 2 Chilienu aka-unu elu n'idi-nsọ, Gọzi kwa Jehova. 3 Ka Jehova si na Zaion gọzie gi, Bú Onye keworo elu-igwe na uwa.

Abù Ọma 135

1 Tonu Ja. Tonu aha Jehova; Tonu Ya, ndi-orù Jehova: 2 Ndi nēguzo n'ulo Jehova, N'ogige nile nke ulo Chineke-ayi. 3 Tonu Ja; n'ihi na Jehova di nma: Bùkuenu aha-Ya abù ọma; n'ihi na ọ di utọ. 4 N'ihi na Jekob ka Ja rọputaworo nye Onwe-ya, Ọ rọputara Israel ka ọ buru ihe nke aka Ya. 5 N'ihi na mu onwem amawo na Jehova di uku, Onye-nwe-ayi di kwa elu kari chi nile. 6 Ihe nile nke tọrọ Jehova utọ, nke ahu ka O meworo, N'elu-igwe, na n'uwa, na n'oké osimiri nile, na ob͕u-miri nile. 7 Ọ bu Onye nēme ka alulu si na nsọtu uwa kwugo; O meworo miri-ozuzo àmùmà; Ọ bu Onye nēme ka ifufe si n'ulo-nkwakọba-Ya nile puta. 8 Onye tib͕uru umu eburu uzọ mu n'ala Ijipt, Ma ọ bu madu ma-ọbu anu-ulo. 9 O zitere ihe-iriba-ama di iche iche na ihe-ebube di iche iche n'etiti gi, Ijipt, N'aru Fero, na n'aru ndi-orù-ya nile. 10 Onye tib͕uru ọtutu mba, B͕u kwa ndi-eze di ike; 11 Bú Saihon eze ndi-Amorait, Na Og eze Beshan, Na ala-eze nile nke Kenean: 12 Ọ we nye ala-ha ibu ihe-nketa, Iburu Israel, bú ndi-Ya, ihe-nketa. 13 Jehova, aha-Gi nādiru mb͕e ebighi-ebi; Jehova, ncheta-Gi nādiru ọb͕ọ nile. 14 N'ihi na Jehova gēkpe ndi-Ya ikpe, Chèghari kwa uche-Ya bayere ndi-orù-Ya. 15 Arusi nile nke mba nile bu ọla-ọcha na ọla-edo, Ọlu aka madu. 16 Ha nwere ọnu ma ha adighi-ekwu okwu; Ha nwere anya abua, ma ha adighi-ahu uzọ; 17 Ha nwere nti abua, ma ha adighi-aṅa nti; Ọ dighi kwa iku-ume di n'ọnu-ha. 18 Ndi nēme ha gādi ka ha; E, onye ọ bula nke nātukwasi ha obi. 19 Ulo Israel, gọzienu Jehova: Ulo Eron, gọzienu Jehova: 20 Ulo Livai, gọzienu Jehova: Unu ndi nātu egwu Jehova, gọzienu Jehova. 21 Onye agọziri agọzi ha Jehova bu site na Zaion, Onye bi na Jerusalem. Tonu Ja.

Abù Ọma 136

1 Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. 2 Kelenu Chineke kachasi chi nile: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. 3 Kelenu Onye-nwenu kachasi ndi-nwenu nile: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. 4 Kelenu Onye nání Ya nālu oké ọlu di iche iche: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. 5 Kelenu Onye ji nghọta eme elu-igwe: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. 6 Kelenu Onye meworo ala ka ọ sa mbara n'elu miri: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: 7 Kelenu Onye meworo ìhè uku di iche iche: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: 8 Bú anyuanwu ichi n'ehihie: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. 9 Na ọnwa na kpakpando ichi n'abali: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. 10 Kelenu Onye nētib͕u Ijipt nime umu-ha eburu uzọ mu: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: 11 O we me ka Israel si n'etiti ha puta: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: 12 Site n'aka di ike na n'ogwe-aka esetiri eseti: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. 13 Kelenu Onye kebiworo Oké Osimiri Uhie: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: 14 O we me ka Israel gabiga n'etiti ya: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: 15 Ma O rurupuru Fero na usu-ndi-agha-ya n'Oké Osimiri Uhie: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: 16 Kelenu Onye nēme ka ndi-Ya je ije n'ọzara: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ēbi ka ebere-Ya di. 17 Kelenu Onye tib͕uworo ndi-eze di uku: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: 18 O b͕u-kwa-ra ndi-eze di ebube: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: 19 Bú Saihon eze ndi-Amorait: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: 20 Na Og eze Beshan: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: 21 O we nye ala-ha ibu ihe-nketa: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: 22 Iburu Israel, bú orù-Ya, ihe-nketa: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. 23 Onye chetara ayi n'ọnọdu-ayi di ala: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: 24 O we naputa ayi n'aka ndi nākpab͕u ayi. N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. 25 Ọ nēnye anu-aru nile nri: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. 26 Kelenu Chineke nke elu-igwe: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

Abù Ọma 137

1 N'akuku osimiri nile nke Babilon, N'ebe ahu ka ayi nọduru ala, e, ayi kwara ákwá, Mb͕e ayi chetara Zaion. 2 N'osisi willow di n'etiti yaKa ayi nēkokwasi ubọ-akwara nile ayi. 3 N'ihi na n'ebe ahu ka ndi nādọta ayi n'agha riọro n'aka-ayi okwu abù, Ndi lutara ihe-ayi n'agha riọ-kwa-ra ayi ka ayi ṅuria ọṅu, si, Bùaranu ayi otù nime abù Zaion. 4 Àyi gēsi aṅa bù abù JehovaN'ala nke onye ala ọzọ? 5 Ọ buru na echezọm i, Jerusalem, Ka aka-nrim chezọ ǹkà-ya. 6 Ka irem rapara n'okpo-ọnum, Ma ọ buru na adighm-echeta gi; Ma ọ buru na adighm-eme ka Jerusalem di eluN'elu isi ọṅùm. 7 Jehova, cheta ubọchi JerusalemMegide umu Edom; Ndi nāsi, B͕abanu ya ọtọ, b͕abanu ya ọtọ, Rue ntọ-ala di nime ya. 8 Gi ada Babilon, nke bu onye anāpunara ihe; Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú onye gākwughachi giNmeso-gi nke i mesoworo ayi. 9 Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú onye gāchiri umu-gi nāṅu ara tupia haNa nkume di elu.

Abù Ọma 138

1 M'gēji obim nile kele Gi: N'iru chi nile ka m'agābùku Gi abù ọma. 2 M'gākpọ isi ala n'ebe ulo uku nsọ Gi di, M'gēkele kwa aha-Gi n'ihi ebere-Gi na n'ihi ezi-okwu-Gi: N'ihi na I mewo ka okwu-ọnu-Gi di uku n'elu aha-Gi nile. 3 N'ubọchi m'kpọkuru Gi ka I zaram, I nēji ike di na nkpuru-obim kpaliem. 4 Eze nile nke uwa gēkeli Gi, Jehova, N'ihi na ha anuwo okwu nile nke ọnu-Gi. 5 Ha gābù kwa abù bayere uzọ nile nke Jehova; N'ihi na ebube Jehova di uku. 6 N'ihi na Jehova di elu, ma ọ bu onye di ume-ala n'obi ka Ọ nāhu anya: Ma onye-npako, Ọ nēsite n'ebe di anya mara ya. 7 Ọ buru na ejeghariam n'etiti ahuhu, I gēme ka m'di ndu; I gēseti aka-Gi imegide iwe ndi-irom, Aka-nri-Gi gāzọputakwam. 8 Jehova gēmezurum ihe nile: Jehova, ebere-Gi nādiru mb͕e ebighi-ebi; Arala aka n'ọlu nile nke aka-gi abua.

Abù Ọma 139

1 Jehova, I gwuputawo ala obim, I we maram. 2 Gi onwe-gi amawo nnọdu-alam na nbili-ọtọm, I nāghọta èchìchèm nile site n'ebe di anya. 3 Okporo-uzọm na ndina-alam ka I fùchaworo dika ọka, Ọ bu kwa uzọm nile ka I maworo nke-ọma. 4 N'ihi na ọ dighi okwu di n'irem, Ma, le, Jehova, I machasiwo ya. 5 N'azu na n'iru ka I nọchigideworom, we tukwasi ọbu-aka-Gi n'arum. 6 Ọmuma-ihe di otú a dikaririm ebube; Ọ dika elu, apughm iru ya. 7 Òle ebe m'gālanari Mọ-Gi? Ma-ọbu òle ebe m'gēsi n'iru Gi b͕alaga? 8 Ọ buru na arigom n'elu-igwe, n'ebe ahu ka I nọ: Ọ buru kwa na ab͕asam utem n'ala-mọ, le, I nọ n'ebe ahu. 9 Ọ buru na achirim nkù nke ututu, Biri n'akuku dikarisiri anya nke oké osimiri, 10 Ọbuná n'ebe ahu ka aka-Gi gēdurum, Aka-nri-gi gējidekwam. 11 M'we si, N'ezie, ọchichiri gēkpuchim; Ma abali ghọrọ ìhè buruburum. 12 Ọbuná ọchichiri adighi-ab͕achiri Gi; Ma abali nēnye ìhè dika ehihie: Dika ọchichiri si di, otú a ka ìhè di n'anya-Gi 13 N'ihi na Gi onwe-gi enwetawo akurum abua: I nākpam n'afọ nnem dika esi ákpa ákwà. 14 M'gēkele Gi; n'ihi na ejiwo ihe di iche iche di egwu me ka m'buru oké ọlu: Oké ọlu ka ọlu-Gi nile di; Nkpuru-obim ma-kwa-ra ya nke-ọma. 15 Ọkpukpum ezopughi n'anya-Gi, Mb͕e emerem na nzuzo, Mb͕e adurum nke-ọma, dika onye-ọ̀kà-ọdudu-ákwà si adu, n'ebe nile di ala nke uwa. 16 Anya-Gi abua huru arum mb͕e o kēzughi okè, Ọ bu kwa n'akwukwọ-Gi ka edere ihe nile dim n'aru, Nke akpuru kwa-ubọchi, Mb͕e ọ dighi otù ihe di nime ha. 17 Le ka èchìchè-Gi nile si di oké ọnu-ahia n'anyam, Chineke! Le ka ọnu-ọgugu nile ha si di uku ri nne! 18 Ọ buru na aguam ha ọnu, ha bara uba kari ájá: Mb͕e m'tetaworo, mu na I nānọgide. 19 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na I b͕ue onye nēmebi iwu, Chineke: Ya mere, unu ndi-ọbara, sinu n'ebe m'nọ wezuga onwe-unu. 20 Ha bu ndi nēkwu okwu megide Gi nime nzube ọjọ, Ndi ebuliworo nye ihe-efu ka ndi-iro-Gi bu. 21 Ọ̀ bughi ndi nākpọ Gi asì, jehova, ka m'nākpọ asì? Ọ̀ bughi kwa ndi nēbili imegide Gi ka m'nāsọ oyi? 22 Ọ bu ikpọ-asì nke zuru okè ka m'ji kpọ ha asì: Ndi-iro ka ha burum. 23 Gwuputa ala obim, Chineke, we mara obim: Nānwam, we mara iche-uchem nile: 24 Hu kwa ma ọ di uzọ ọ bula nēweta ihe-nb͕u di nimem, Durukwam n'uzọ ebighi-ebi.

Abù Ọma 140

1 Jehova, dọputam n'aka madu ọjọ; Chebem ka m'ghara ida n'aka nwoke nēme ihe-ike di iche iche: 2 Ndi chèworo ihe ọjọ di iche iche n'obi-ha; Ubọchi nile ọ bula ka ha nēzukọ ibu agha di iche iche. 3 Ha amuwo ire-ha dika agwọ; Edide aju-ala di n'okpuru eb͕ub͕ere-ọnu-ha. Selah 4 Debem, Jehova, ka m'ghara ida n'aka onye nēmebi iwu; Chebem, ka m'ghara ida n'aka nwoke nēme ihe-ike: Bú ndi chèworo inuda nzọ-ukwum nile. 5 Ndi-npako ezobeworom ib͕udu, na udọ̀ di iche iche; Ha ab͕asowo ub͕u n'akuku uzọ; Ọnyà di iche iche ka ha siworom. Selah 6 Asirim Jehova, Chinekem ka I bu: Ṅa nti olu aririọ-amaram nile, Jehova. 7 Jehova, Onye-nwe-ayi, ike nke nzọputam, I kpuchiwo isim n'ubọchi ihe-agha nile. 8 Jehova, enyela ihe onye nēmebi iwu nāchọsi ike; Emela ka nzube ọjọ ya gara ya; ha nēbuli onwe-ha elu. Selah 9 Ma isi ndi nọm buruburu, Ka nmeb͕u nke eb͕ub͕ere-ọnu-ha kpuchie ha. 10 Ka ha me ka icheku-ọku me nkpatu imegide ha: Ya me ka ha dabà n'ọku; N'ob͕u-miri, ka ha we ghara ibili ọzọ. 11 Madu nke nwere ire ọjọ agaghi-eguzosi ike n'uwa: Madu nke nēme ihe-ike, ihe ọjọ ga-chunta ya inudasi ya. 12 Amawom na Jehova gēmezi okwu-ikpe onye ewedara n'ala, Na ikpé ziri ezi nke ndi-ob͕eye. 13 N'ezie ndi ezi omume gēkele aha-Gi: Ndi ziri ezi gēbi n'iru Gi.

Abù Ọma 141

1 Jehova, akpọkuwom I; biakutem ọsọsọ: Ṅa nti olum, mb͕e m'kpọkuru Gi. 2 Ka edozie ekperem dika ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'iru Gi; Ka nchili ọbu-akam buru onyinye-inata-iru-ọma nke anyasi. 3 Jehova, Do nche n'iru ọnum; Chebe ọnu-uzọ eb͕ub͕ere-ọnum abua. 4 Ewezugala obim ime ihe ọjọ, Iji nmebi-iwu nēme omume, Mu na madu ndi nālu ajọ ihe: Ekwe-kwa-la ka m'rie ihe ọ bula nihe-utọ n'ile ha. 5 Ka onye ezi omume tib͕uem, ọ gābu ebere; Ya ba-kwa-ram nba, ọ gābu manu isi; Ekwela ka isim si, É-è: N'ihi na m'nọ nēkpe ekperem imegide ihe ọjọ ha nile. 6 Atudawo ndi-ikpe-ha n'akuku nkume di elu; Ha gānu kwa okwu-ọnum nile; n'ihi na ha di utọ. 7 Dika mb͕e madu nālu ọlu ubi we nēgwuwa ala, Otú a ka esesaworo ọkpukpu-ayi n'ọnu ala-mọ. 8 N'ihi na ọ bu n'ebe I nọ, Jehova, Onye-nwe-ayi, ka anyam abua di: Nime Gi ka m'b͕abàworo; ab͕apula nkpuru-obim dika miri. 9 Debem ka m'ghara idabà n'ib͕udu ha sirim, Na n'ọnyà ndi nālu ajọ ihe. 10 Ka ndi nēmebi iwu dabà n'ub͕u nile nke aka ha n'otù n'otù, Rue mb͕e mu onwem gāgabiga.

Abù Ọma 142

1 Olum ka m'ji etiku Jehova; Olum ka m'ji ariọ Jehova aririọ-amara. 2 Anamekwuwa okwu ntamum n'iru Ya; Ahuhum ka m'nēgosi n'iru Ya. 3 Mb͕e mọm nēnweghi ike nimem, Gi onwe-gi mara okporo-uzọm. N'uzọ nke m'nēje ije nime ya ka ha zobeworom ib͕udu. 4 Legide n'aka-nrim, hu kwa, n'ihi na ọ dighi onye m'nwere nke nāmatam: Ebe-nb͕alaga alanariwom n'iyì; ọ dighi onye nāju ajuju bayere nkpuru-obim. 5 Etikurum I, Jehova; Asirim, Gi onwe-gi bu ebe-nb͕abàm, Na òkèm n'ala ndi di ndu. 6 Ṅa nti n'iti-nkpum; n'ihi na enweghm ike ma-ọli: Naputam n'aka ndi nēsob͕um; n'ihi na ha nwere ume karim. 7 Me ka nkpuru-obim si n'ebe emechibidoworo ya puta, ka m'we kele aha-Gi: Mu ka ndi ezi omume gāb͕a buruburu; N'ihi na I nēmesom nke-ọma.

Abù Ọma 143

1 Jehova, nuru ekperem; ṅa nti n'aririọ-amaram nile: N'ikwesi-ntukwasi-obi-Gi zam, na n'ezi omume-Gi. 2 Eji-kwa-la orù-Gi ba n'ikpé; N'ihi na ọ dighi onye ọ bula nke di ndu bu onye ezi omume n'iru Gi. 3 N'ihi na onye-iro esob͕uwo nkpuru-obim; Ọ zọpiawo ndum n'ala: O mewom ka m'biri n'ebe di iche iche b͕ara ọchichri, dika ndi nwuru anwu site na mb͕e ebighi-ebi. 4 Mọm we ghara inwe ike nimem; Ibobo nānwu obim nimem. 5 Echetawom ubọchi nile nke mb͕e ochie; Atughariwom uche n'omume-Gi nile: N'ọlu aka-Gi abua ka m'tughariworo obi. 6 Ab͕asawom akam abua n'ebe I nọ: Nkpuru-obim di ka ala nke ida-#mbà n'ebe I nọ. Selah 7 Zam ngwa ngwa, Jehova; mọm agwusiwo: Ezonarilam iru-Gi; Ka m'we ghara iyi ndi nārida n'olùlù. 8 Mem ka m'nuru ebere-Gi n'ututu; N'ihi na Gi ka m'tukwasiworo obi: Mem ka m'mara uzọ nke m'gēje ije nime ya; N'ihi na Gi ka m'buliworo nkpuru-obim nye. 9 Naputam n'aka ndi-irom, Jehova: N'ebe I nọ ka m'kpuchiworo onwem. 10 Zím ime ihe di Gi utọ; n'ihi na Gi onwe-gi bu Chinekem: Mọ-Gi di nma; durum n'ala di lari. 11 N'ihi aha-Gi, Jehova, me ka m'di ndu: N'ezi omume-Gi me ka nkpuru-obim puta n'ahuhu. 12 Ọzọ, n'ebere-Gi kpochapu ndi-irom, Me kwa ka ndi nile ndi nākpab͕u nkpuru-obim la n'iyì; N'ihi na mu onwem bu orù-Gi.

Abù Ọma 144

1 Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú oké nkumem, bu, Onye nēzí akam abua ilu ọ̀gù: Onye nēzí nkpisi-akam ibu agha: 2 Eberem, na ebem ewusiri ike, Na ulo-elum, na onye m'nwere ime ka m'b͕apu; Na ọtam, na onye m'b͕abàworo nime ya; Onye nāzọda ndim n'okpurum. 3 Jehova, gini ka madu bu, nke I nāmara ya? Na nwa nke madu, nke I nēchè èchìchè bayere ya? 4 Madu yiri otù nku-umeUbọchi-ya nile di ka onyinyo nāgabiga. 5 Jehova, rulata elu-igwe-Gi, we rida: Metu ugwu aka, ha gākwu kwa anwuru-ọku. 6 Me ka àmùmà b͕uputa, we me ka ha b͕asa; B͕apu àkú-Gi nile, we chusa ha. 7 Si n'elu setipu aka-Gi; Dọputam, naputakwam n'ọtutu miri, N'aka ndi ala ọzọ; 8 Ndi ọnu-ha kwuworo okwu efu, Aka-nri-ha bu kwa aka-nri ugha. 9 Chineke, abù ọhu ka m'gābùku Gi: Une nke akwara iri ka m'gēji bùkue Gi abù ọma. 10 Ọ bu onye nēnye ndi-eze nzọputa: Onye nādọputa Devid, bú orù-Ya, n'ọnu mma-agha jọrọ njọ. 11 Dọputam, nāputakwam n'aka ndi ala ọzọ, Ndi ọnu-ha kwuworo okwu efu, Aka-nri-ha bu kwa aka-nri ugha. 12 Mb͕e umu-ayi ndikom di ka ihe akuru n'ala, ndi anēme ka ha bùe ibù mb͕e ha di na nwata; Umu-ayi ndinyom di ka ogidi nkuku ulo atuworo akika dika ihe-atù nke ulo uku; 13 Ọba-ayi ejuwo, nēweputa ihe nile di iche iche; Igwè ewu na aturu nile ayi nāmuputa nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri, orú nnù na nnù ise orú nnù na nnù ise, n'èzí nile ayi; 14 Anēboju ehi nile ayi ibu nke-ọma; Ọ dighi nitpú di na mb͕idi-ayi, ọ dighi kwa ọpupu di, Ọ dighi kwa iti-nkpu di n'amá nile ayi; 15 Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi ahu bu, nke di otú a: Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi ahu bu, nke Jehova bu Chineke-ha.

Abù Ọma 145

1 M'gēme Gi ka I di elu, Chinekem, bú Eze; M'gāgọzi kwa aha-Gi rue mb͕e nile ebighi-ebi. 2 Kwa-ubọchi ka m'gāgọzi Gi; M'gēto kwa aha-Gi rue mb͕e nile ebighi-ebi. 3 Onye uku ka Jehova bu, Ọ bu kwa onye anēto nke-uku; Ọ dighi kwa ngwuputa-ala diri idi-uku-Ya. 4 Otù ọb͕ọ gāja ọlu-Gi nile na nti ọb͕ọ ọzọ, We gosi idi-ike-Gi nile. 5 N'ima-nma nke nsọpuru nke ebube-Gi, Na n'oké ọlu-Gi nile, ka m'gātughari uche. 6 Ọ bu kwa ike nke ọlu-Gi nile di egwu ka ha gēkwuputa; Ọ bu kwa idi-uku-Gi ka m'gākọ akukọ-ya. 7 Ncheta nke iba-uba nke idi-nma-Gi ka ha ga-ekwukwa, Ọ bu kwa ezi omume-Gi ka ha gēti nkpu ọṅù bayere ya. 8 Onye di amara na onye nwere obi-ebere ka Jehova bu; Ọ dighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ di kwa uku n'ebere. 9 Jehova di nma n'ebe ihe nile ekère èkè di; Obi-ebere-Ya nile dikwasi kwa n'ọlu-Ya nile. 10 Ọlu-Gi nile nēkele Gi, Jehova; Ndi-ebere-Gi nāgozi kwa Gi. 11 Nsọpuru nke ala-eze-Gi ka ha nēkwuputa, Ọ bu idi-ike Gi ka ha nēkwu okwu bayere ya; 12 Ime ka umu madu mara idi-ike-Ya nile, Na nsọpuru nke ima-nma nke ala-eze-Ya. 13 Ala-eze-Gi bu ala-eze rue mb͕e nile ebighi-ebi, Ọchichi-Gi di kwa n'ọb͕ọ nile. 14 Jehova nākwagide ndi nile nāda ada, O nēkuli kwa ndi nile nēruda n'ala. 15 Anya ihe nile nēle anya Gi; Gi onwe-gi nēnye kwa ha ihe-oriri-ha na mb͕e-ya. 16 I nāsaghe aka-Gi, I nēwere kwa ihe di ihe ọ bula di ndu utọ me ka afọ ju ya. 17 Onye ezi omume ka Jehova bu n'uzọ-Ya nile, Ọ di kwa ebere n'ọlu-Ya nile. 18 Jehova di nso ndi nile nākpọku Ya, Bú ndi nile nākpọku Ya n'ezi-okwu. 19 Ihe di ndi nātu egwu Ya utọ ka Ọ gēme; Ọ bu kwa ntiku-ha ka Ọ gānu, we zọputa ha. 20 Jehova nēdebe ndi nile nāhu Ya n'anya; Ma ndi nile nēmebi iwu ka Ọ gēkpochapu. 21 Otuto Jehova ka ọnum gēkwu; Ka anu-aru nile gọzi kwa aha nsọ Ya rue mb͕e nile ebighi-ebi.

Abù Ọma 146

1 Tonu Ja. Nkpuru-obim, to Jehova. 2 M'gēto Jehova n'ogologo ndum nile: M'gābùku Chinekem abù ọma mb͕e m'nọ nādi ndu. 3 Unu atukwasila obi n'aru ndi amara aha-ha, Ma-ọbu n'aru nwa nke madu, onye ọ nādighi nzọputa o nwere. 4 Mọ-ya nāpu apu, o we laghachi n'ala o si puta; N'ubọchi ahu èchìchè-ya nile alawo n'iyì. 5 Onye ihe nāgara nke-ọma ka onye ahu bu nke Chineke nke Jekob bu Onye nēyere ya aka, Nke olile-anya-ya dikwasi Jehova, bú Chineke-ya: 6 Onye meworo elu-igwe na uwa, Na oké osimiri, na ihe nile nke di nime ha; Onye nēdebe ezi-okwu rue mb͕e ebighi-ebi: 7 Onye nēmere ndi anēmeb͕u ihe O kpere n'ikpe; Onye nēnye ndi agu nāgu nri: Jehova nātọpu ndi-nkpọrọ; 8 Jehova nēmeghe anya ndi-ìsì; Jehova nēkuli ndi nēruda n'ala; Jehova n'ahu ndi ezi omume n'anya; 9 Jehova nēdebe ndi ala ọzọ; Nwa-nb͕ei na nwayi di-ya nwuru ka Ọ nēme ka ha guzo ọtọ; Ma uzọ ndi nēmebi iwu ka Ọ nēme ka ọ b͕agọ ab͕agọ. 10 Jehova gābu eze rue mb͕e ebighi-ebi, Chineke-gi, Zaion, gābu eze rue ọb͕ọ nile. Tonu Ja.

Abù Ọma 147

1 Tonu Ja; N'ihi na ọ di nma ibùku Chineke-ayi abù ọma; N'ihi na ọ di utọ, otuto mara nma. 2 Jehova nēwuli Jerausalem elu; Ndi adọtara n'agha nke Israel ka Ọ nāchikọta. 3 Ọ bu onye nēme ka ndi obi-ha tiwara etiwa diri ndu, Ọ nēkechi kwa ihe-nb͕u nile ha. 4 Ọ nāguta ọnu-ogugu kpakpando; Ha nile ka Ọ nākpọ aha. 5 Onye uku ka Onye-nwe-ayi bu, O nwe-kwa-ra ike riri nne; Nghọta-Ya enweghi ọnu-ọgugu. 6 Jehova nēme ka ndi di ume-ala n'obi guzo ọtọ: Ọ nēme ka ndi nēmebi iwu di ala ọbuná rue ala. 7 Werenu ekele za Jehova, Werenu ubọ-akwara bùkue Chineke-ayi abù ọma: 8 Onye ji igwe-oji ekpuchi elu-igwe, Onye nēdoziri ala miri-ozuzo, Onye nēme ka ugwu nile pue ahihia. 9 Ọ nēnye anumanu nri-ya, Nēnye kwa umu-ugolo-ọma nke nākpọlu Ya. 10 Ọ bughi idi-ike nke inyinya nātọ Ya utọ: Ọ bughi ogwe-ukwu abua nke nwoke nādi Ya utọ. 11 Ihe nātọ Jehova utọ bu ndi nātu egwu Ya, Ndi nēchere ebere-Ya. 12 Gi Jerusalem, nāja Jehova; To Chineke-gi, Zaion. 13 N'ihi na O mewo ka ihe-ntuchi nile nke ọnu-uzọ-ama-gi nile di ike; Ọ gọziwo umu-gi n'etiti gi. 14 Ọ bu onye nēme ka ókè-ala-gi ghọ udo; Abuba ọka wheat ka O ji me ka i riju afọ. 15 Ọ bu onye nēzisa okwu-ọnu-Ya n'uwa; Ngwa ngwa ka okwu-Ya nāb͕a ọsọ. 16 Ọ bu onye nēnye snow dika aji-anu; Ọ nēfesa hoar-frost dika ntu. 17 Ọ nātupu ice-Ya dika iberibe achicha: Ònye gēguzo n'iru oyi-Ya? 18 Ọ nēzipu okwu-Ya, we b͕aze ha: Ọ nēme ka ifufe-Ya fe, miri we rùe. 19 Ọ nēgosi Jekob okwu-Ya, Nēgosi kwa Israel ukpuru-Ya nile na ikpé-Ya nile. 20 O mesoghi mba ọ bula otú a: Ma ikpé-Ya nile, ha amaghi ha. Tonu Ja.

Abù Ọma 148

1 Tonu Ja. Tonu Jehova site n'elu-igwe: Tonu Ya n'ebe di elu. 2 Tonu Ya, ndi-mọ-ozi-Ya nile: Tonu Ya, usu-ndi-agha-Ya nile. 3 Tonu Ya, anyanwu na ọnwa: Tonu Ya, kpakpando nile nke ìhè. 4 Tonu Ya, elu-igwe nke elu-igwe, Na miri nke di n'elu elu-igwe. 5 Ka ha to aha Jehova: N'ihi na Ya onwe-ya nyere iwu, ewe kè ha. 6 O we me ka ha guzo rue mb͕e nile ebighi-ebi: Ukpuru ka Ọ nyeworo nke na-agaghi agabiga. 7 Tonu Jehova site n'uwa, Unu ogologo anu-miri, na ob͕u-miri nile: 8 Ọku, na ákú-miri-ígwé, na snow, na alulu: Oké ifufe, nke nēme okwu-Ya: 9 Ugwu nile na ugwu ntà nile; Osisi nile nāmi nkpuru na osisi cedar nile: 10 Anu-ọhia na anu-ulo nile; Ihe nākpu akpu na nnunu nwere nkù: 11 Ndi-eze uwa na ndi nile di iche iche; Ndi-isi na ndi-ikpé nile nke uwa: 12 Ma umu-okorọbia ma umu-ab͕ọghọ; Ndi-agadi, ha na umu-ntakiri: 13 Ka ha too aha Jehova; N'ihi na emewo ka aha-Ya di elu, nání ya: Ebube-Ya di n'elu uwa na elu-igwe. 14 O we me ka mpi ndi-Ya nwere di elu, Iburu ndi-ebere-Ya nile otuto; Bú umu Israel, ndi di nso Ya. Tonu Ja.

Abù Ọma 149

1 Tonu Ja. Bùkuenu Jehova abù ọhu, Bú otuto-Ya nime nkpọkọta ndi-ebere-Ya. 2 Ka Israel ṅuria n'Onye meworo ya: Ka umu Zaion tegharia egwú ọṅù n'Eze-ha. 3 Ka ha to aha-Ya n'ite-egwú: Ka ha chiri egwú-otiti na ubọakwara bùkue Ya abù ọma. 4 N'ihi na ihe ndi-Ya nātọ Jehova utọ: Ọ gēji nzọputa chọ ndi di ume-ala n'obi nma. 5 Ka ndi-ebere ṅuri ọṅu-agha nime nsọpuru: Ka ha tie nkpu ọṅò n'elu ihe-ndina-ha. 6 Ka nbuli-elu Chineke di n'olu abu ha, Ka mma-agha nke iru abua di kwa n'aka-ha; 7 Ibọ̀ ọ́bọ̀ n'aru mba nile, Ibara ndi nile di iche iche nba; 8 Iji nkpọrọ ke ndi-eze-ha, Na iji nkpọro-ukwu ígwè ke ndi-ha anāsọpuru; 9 Ime n'aru ha ikpé edere n'akwukwọ: Ihe mara nma ka ọ bu nke ndi-ebere-Ya nile nwere. Tonu Ja.

Abù Ọma 150

1 Tonu Ja. Tonu Chineke n'ebe nsọ Ya: Tonu Ya na mbara-ígwé nke ike-Ya. 2 Tonu Ya n'ihi idi-ike-Ya nile: Tonu Ya dika iba-uba nke idi-uku-Ya si di. 3 Werenu ọfufù opì-ike to Ya: Chirinu une na ubọ-akwara to Ya. 4 Werenu egwú-otiti na ite-egwú to Ya: Chirinu ubọ eji akwara kwe na ọ̀jà to Ya: 5 Chirinu ájà nke anānu nke-ọma to Ya: Chirinu ájà nke nādasi udà ike to Ya. 6 Ka ihe ọ bula nke nēku ume to Ja. Tonu Ja.

Ilu 1

1 Ilu di iche iche nke Solomon nwa Devid, bú eze Israel: 2 Ima amam-ihe na idọ-aka-na-nti; Ighọta okwu-ọnu nile nke nghọta; 3 Inara idọ-aka-na-nti nke inwe-uche, Na ezi omume na ikpé na izi-ezi; 4 Inye ndi nēnweghi uche ezi uche, Inye nwa-okorọbia ihe-ọmuma na ìzùzù: 5 Ka onye mara ihe we nu, we tukwasi ihe-nmuta n'amam-ihe-ya; Ka onye-nghọta we nweta kwa ezi ndum-ọdu: 6 Ighọta ilu, na okwu miri emi; Okwu nile nke ndi mara ihe, na okwu-omimi nile ha. 7 Egwu Jehova bu nmalite ihe-ọmuma: Amam-ihe na idọ-aka-na-nti ka ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche ledaworo anya. 8 Nwam, nuru idọ-aka-na-nti nke nna-gi, Arapu-kwa-la iwu nne-gi: 9 N'ihi na okpu amara ka ha gāburu isi-gi, Ihe-inya-n'olu ka ha gāburu olu-gi. 10 Nwam, ọ buru na ndi-nmehie arà gi urà, Ekwela. 11 Ọ buru na ha asi, Soro ayi je, Ka ayi che anwu ọbara, Ka ayi zobe onwe-ayi ijide onye nēmeghi ihe ọjọ n'efu; 12 Ka ayi lo ha na ndu dika ala-mọ, Bú ndi zuru okè, dika ndi nārida n'olùlù; 13 Ihe nile di oké ọnu-ahia ka ayi gāchọta, Ayi gākwaju ulo-ayi nile n'ihe ayi kwatara n'agha; 14 Nzà-gi ka i gēfe n'etiti ayi; Otù akpa-ego ka ayi nile gēnwekọ: 15 Nwam, esola ha je n'uzọ; B͕ochie ukwu-gi n'iga n'okporo-uzọ-ha: 16 N'ihi na ukwu-ha nāb͕a ọsọ ime ihe ọjọ, Ha nēme kwa ngwa iwusi ọbara. 17 N'ihi na ọ bu n'efu ka anāb͕asa ub͕u, N'anya nnunu ọ bula: 18 Ndia Kwa, ọbara onwe-ha ka ha nēche anwu, Ha nēzobe onwe-ha inwude ndu nke aka ha. 19 Otú a ka uzọ nile nke onye ọ bula nke akpiri urù nēzighi ezi nākpọ nku si di; Ndu nke ndi-nwe-ya ka ọ nēwepu. 20 Amam-ihe nēti nkpu n'èzí; N'amá nile ka ọ nēme ka olu-ya da udà; 21 N'isi ebe nile anātu ùzù ka ọ nākpọ òkù; N'oghere ọnu-uzọ-ama nile, N'obodo, ka o nēkwu okwu-ọnu-ya nile: 22 Unu ndi nēnweghi uche, rùe ole mb͕e ka unu gāhu enweghi-uche n'anya? Rùe ole mb͕e ka ndi nākwa emò gāchọsi-kwa-ra onwe-ha ikwa-emò ike? Rùe ole mb͕e ka ndi-nzuzu gākpọ kwa ihe-ọmuma asì? 23 Laghachinu n'iba-nbam: Le, m'gāwupuru unu mọm, M'gēme ka unu mara okwum nile. 24 N'ihi na akpọwom òkù, unu we ju; Esetipuwom akam, ma ọ dighi onye nāṅa nti; 25 Unu we wezuga ndum-ọdum nile, Unu achọghi kwa iba-nbam: 26 Mu onwem kwa, na nhuju-anya-unu m'gāchì ọchì; M'gākwa emò mb͕e oké egwu-unu nābia; 27 Mb͕e oké egwu-unu nābia dika ikuku siri ike, Mb͕e nhuju-anya-unu nābiaru kwa dika oké ifufe; Mb͕e ahuhu na nkpà nābiakwasi unu. 28 Mb͕e ahu ka ha gākpọkum, ma m'gaghi-aza; Ha gāchọsim ike, ma ha agaghi-achọtam: 29 N'ihi na ha kpọrọ ihe-ọmuma asì, Na n'ihi na ọ bughi egwu Jehova ka ha rọputara: 30 Ha achọghi ndum-ọdum; Ha lelìri iba-nbam nile: 31 Ha gēri kwa ufọdu nime nkpuru nke uzọ-ha, Ọ bu kwa ndum-ọdu nile nke aka ha gēju ha afọ. 32 N'ihi na nchighari-azu nke ndi nēnweghi uche gēb͕u ha, Ọ bu kwa inọ-n'udo nke ndi-nzuzu gēme ka ha la n'iyì. 33 Ma onye nēgem nti gēbi na ntukwasi-obi, Ọ gānọ kwa jū nātughi oké egwu ihe ọjọ.

Ilu 2

1 Nwam, ọ buru na i nara okwu-ọnum nile, Ọ buru kwa na i zobe ihe nile m'nyere n'iwu n'ebe i nọ; 2 Itọrọ amam-ihe nti-gi n'ala, We wezuga obi-gi inwe nghọta; 3 E, ọ buru na ọ bu nmata ka i nākpọku, Ọ buru kwa na ọ bu nghọta ka i nēweliri olu-gi; 4 Ọ buru na i chọ ya dika ọla-ọcha, Ọ buru kwa na ọ bu dika àkù zoro ezo ka i nēgwuputa ya: 5 Mb͕e ahu ka i gāghọta egwu Jehova, Ọ bu kwa ihe-ọmuma Chineke ka i gāchọta. 6 N'ihi na Jehova nēnye amam-ihe; N'ọnu-Ya ka ihe-ọmuma na nghọta si aputa: 7 O nēzobere ndi ziri ezi nzube-ihe, Ọ bu ọta ndi nēje ije n'izu-okè nwere; 8 Iche okporo-uzọ nile nke ikpé, Ọ bu kwa uzọ ndi-ebere-Ya ka Ọ nēdebe. 9 Mb͕e ahu ka i gāghọta ezi omume na ikpé, Na izi-ezi nile, e, ezi uzọ ọ bula. 10 N'ihi na amam-ihe gābà n'obi-gi, Ihe-ọmuma gādi kwa nkpuru-obì-gi utọ; 11 Ìzùzù ganēche gi nche, Nghọta gēchebe gi: 12 Inaputa gi n'uzọ onye ọjọ, N'aka madu nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu; 13 Bú ndi nārapu okporo-uzọ nile nke izi-ezi, Ka ha we je ije n'uzọ nile nke ọchichiri; 14 Ndi nāṅuri ime ihe ọjọ, Ha nēteghari egwú ọṅù n'ib͕akuta Chineke azu nke onye ọjọ; 15 Ndi okporo-uzọ nile ha b͕agọrọ ab͕agọ, Ha nēsihie kwa n'uzọ nile ha: 16 Inaputa gi n'aka nwayi nābughi nwunye-gi, N'aka nwayi nābughi nwunye-gi nke nēkwu okwu ire-utọ; 17 Nke nārapu di o nwere n'ab͕ọghọ, Ọb͕ub͕a-ndu nke Chineke-ya kwa, o chezọwo ya: 18 N'ihi na uzọ iridaru ọnwu ka ulo-ya bu, Ọ bu kwa uzọ iridaru n'ebe ndi nādighi ndu nọ ka uzọ-ya nile bu. 19 Ndi nile ndi nābakuru ya, ha adighi-alata, Ha adighi-eru kwa okporo-uzọ nile nke ndu: 20 Ka i we je ije n'uzọ ndi di nma, Debe kwa okporo-uzọ nile nke ndi ezi omume. 21 N'ihi na ndi ziri ezi gēbi n'uwa, Ndi zuru okè gāfọdu kwa nime ya. 22 Ma ndi nēmebi iwu ka agēbipu n'uwa, Ọ bu kwa ndi nāghọ aghughọ ka agēropu na ya.

Ilu 3

1 Nwam, echezọla iwum; Ma ka obi-gi chebe ihe nile m'nyere n'iwu: 2 N'ihi na ubọchi ndu nke di ogologo, na ọtutu arọ nke ndu, Na udo, ka ha gātukwasiri gi. 3 Ekwela ka ebere na ezi-okwu rapu gi: Ke ha n'olu-gi; De ha n'elu mbadamba nkume, bú obi-gi: 4 Chọta kwa amara na ezi ucheN'anya Chineke na madu. 5 Tukwasi Jehova obi-gi nile, Adabere-kwa-la nghọta-gi: 6 N'uzọ-gi nile mara Ya, Ya onwe-ya gēme kwa ka okporo-uzọ-gi nile zie ezi. 7 Abula onye mara ihe n'anya gi onwe-gi; Tua egwu Jehova, we si n'ihe ọjọ wezuga onwe-gi: 8 Ya buru ihe nāgwọ otubo-gi, Ya buru kwa umi diri ọkpukpu-gi nile. 9 Sọpuru Jehova site n'àkù-gi, Site kwa na nkpuru mbu nke ihe-ọmume-gi nile: 10 Ọba-gi nile gējuputa kwa n'ihe-nriju-afọ, Ebe-nzọcha-nkpuru-vine-gi nile gētiwa kwa na manya-vine ọhu. 11 Nwam, ajula idọ-aka-na-nti nke Jehova: Ike agwu-kwa-la gi n'iba-nba-Ya: 12 N'ihi na onye Jehova nāhu n'anya ka Ọ nābara nba; Ọbuná dika nna si abara nwa-ya nke ihe-ya nātọ ya utọ nba. 13 Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu nke chọtaworo amam-ihe bu, Ya na madu nke nēnweputa nghọta. 14 N'ihi na ọzuzú-ahia-ya di nma kari ọzuzú-ahia ọla-ọcha, Urù-ya di nma kari ọla-edo ọma. 15 Ihe di oké ọnu-ahia ka ọ bu kari ruby: Ihe nile kwa nke nātọ gi utọ, ha agaghi-ara ka ya. 16 Ubọchi ndu di ogologo di n'aka-nri-ya; N'aka-ekpe-ya ka àkù na nsọpuru di. 17 Uzọ-ya nile bu uzọ nke idi-utọ, Okporo-uzọ-ya nile bu kwa udo. 18 Osisi nēnye ndu ka ọ buru ndi nējide ya aka: E, onye ọ bula nke nējisi ya aka ike bu onye ihe nāgara nke-ọma. 19 Jehova jiri amam-ihe tọ ntọ-ala uwa; O doziri elu-igwe site na nghọta. 20 Ejiri ihe-ọmuma-Ya kewa ob͕u-miri nile, Mbara-ígwé nile ji kwa ya atuda igirigi. 21 Nwam, ekwela ka ha si n'anya-gi abua wezuga onwe-ha; Chebe nzube-ihe na ìzùzù; 22 Ha gābu-kwa-ra nkpuru-obi-gi ndu, Bu-kwa-ra olu-gi amara. 23 Mb͕e ahu ka i ganēje ije n'uzọ-gi na ntukwasi-obi, I gaghi-akpọbì kwa ukwu-gi, 24 Ọ buru na i dina ala, i gaghi-atu oké egwu: E, i gēdina ala, ura-gi gātọ kwa utọ. 25 Atula egwu site n'oké egwu mberede, Ma-ọbu site n'ikuku siri ike nke ndi nēmebi iwu, mb͕e ọ nābia: 26 N'ihi na Jehova gābu ntukwasi-obi-gi, Ọ gēdebe kwa ukwu-gi ka aghara ijide ya. 27 Eb͕ochila ezi ihe na ndi ọ diri, Mb͕e ọ diri ike aka-gi ime ya. 28 Asila madu-ibe-gi, Je, lata, Echi ka m'gēnye gi; Mb͕e ọ di n'aka-gi. 29 Echèputala ihe ọjọ megide madu-ibe-gi, Ebe onye ahu nēbi gi nso na ntukwasi-obi. 30 Gi na madu esela okwu n'efu, Ma ọ buru na o mesoghi gi ihe ọjọ. 31 Ekwosola onye neme ihe-ike ekworo, Arọputa-kwa-la otù efu n'uzọ-ya nile. 32 N'ihi na ihe-árú n'anya Jehova ka onye sihiere esihie bu: Ma n'aka ndi ziri ezi ka ìzù nzuzo Ya di. 33 Ọbubu-ọnu Jehova di n'ulo onye nēmebi iwu; Ma ebe-obibi ndi ezi omume ka Ọ nāgọzi. 34 Ọ buru na ọ bu ndi nākwa emò ka Ya onwe-ya nākwa emò, Ma ọ bu ndi di ume-ala n'obi ka Ọ nēnye amara. 35 Nsọpuru ka ndi mara ihe gēketa; Ma ndi-nzuzu nēbuli nlelì.

Ilu 4

1 Umum, nurunu idọ-aka-na-ntí nke nna, Tọ-kwa-nu nti n'ala ima nghọta: 2 N'ihi na ezi ihe-nmuta ka m'nyeworo unu; Unu arapula iwum. 3 N'ihi na nwa ka m'buru nnam, Di nrò, buru kwa nwa enwere nání ya n'iru nnem. 4 O we zím ihe, sim, Ka obi-gi jide okwum nile; Debe ihe nile m'nyere n'iwu, we di ndu: 5 Nweta amam-ihe, nweta nghọta; Echezọla, esi-kwa-la n'okwu nile nke ọnum wezuga onwe-gi: 6 Arapula ya, ọ gēdebe kwa gi; Hu ya n'anya, ọ gēchebe kwa gi. 7 Isi ihe ka amam-ihe bu; nweta amam-ihe: E, were ihe nile i nwetaworo nweta nghọta. 8 Tukọba ya elu, o gēbuli kwa gi: Ọ gāsọpuru gi, mb͕e i nāb͕aku ya obi. 9 Ọ gēnye isi-gi okpu amara: Okpu-eze mara nma ka ọ gēnye gi n'aka. 10 Nuru, nwam, nara kwa okwu-ọnum nile; Arọ ndu gāba-kwa-ra gi uba. 11 N'uzọ amam-ihe ka m'zíworo gi ihe; Emewom ka i zọ ije n'uzọ nile nke izi-ezi. 12 Mb͕e i nēje ije, agaghi-akpagide nzọ-ukwu-gi; Ọ buru kwa na i b͕a ọsọ, i gaghi-asu ngọngọ. 13 Jide idọ-aka-na-nti aka; arala ya aka: Chebe ya; n'ihi na ya onwe-ya bu ndu-gi. 14 Abàla n'okporo-uzọ ndi nēmebi iwu, Aga-kwa-la n'iru n'uzọ ndi ọjọ. 15 Zere ya, agabigala nime ya; Wezugara ya onwe-gi, gabiga. 16 N'ihi na ha adighi-araru ura, ọ buru na ha adighi-eme ihe ọjọ; Anapuwo kwa ura-ha n'ike, ọ buru na ha adighi-eme ka madu su ngọngọ. 17 N'ihi na ha eriwo nri nke nmebi-iwu, Ọ bu kwa manya nke ihe-ike ka ha nāṅu. 18 Ma okporo-uzọ ndi ezi omume di ka ìhè nēnwu enwu, Nke nāmu aga n'iru n'iru rue mb͕e chi bọchara. 19 Uzọ ndi nēmebi iwu di ka ọchichiri: Ha amaghi ihe ọ bu ha ji asu ngọngọ. 20 Nwam, ṅa nti n'okwum nile; Tọ nti-gi n'ala n'okwu-ọnum nile. 21 Ekwela ka ha si n'anya-gi abua wezuga onwe-ha; Debe ha n'etiti obi-gi. 22 N'ihi na ndu ka ha buru ndi nachọta ha, Ha bu kwa ihe nāgwọ anu-aru-ha nile. 23 Kari ihe-ndebe-gi nile chebe obi-gi; N'ihi na site na ya ka nputa nile nke ndu di. 24 Si n'ebe i nọ wezuga ọnu nēkwu ihe b͕agọrọ ab͕agọ, Me kwa ka eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwuhie ekwuhie di anya n'ebe i nọ. 25 Ka anya-gi abua legide n'iru, Ka mbubere-anya-gi lezi kwa n'iru gi. 26 Me ka okporo-uzọ nke ukwu-gi abua di lari, Ka edozi kwa uzọ-gi nile. 27 Ewezugala onwe-gi n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe: Si n'ihe ọjọ wezuga ukwu-gi.

Ilu 5

1 Nwam, ṅa nti n'amam-ihem; Tọ nti-gi n'ala nye nghọtam: 2 Ka i we debe ìzùzù di iche iche, Ka eb͕ub͕ere-ọnu-gi we chebe kwa ihe-ọmuma. 3 N'ihi na eb͕ub͕ere-ọnu nke nwayi nābughi nwunye-gi nābusi manu-aṅu, Ihe kwọrọ murumuru kari manu ka okpo-ọnu-ya di kwa: 4 Ma ikpe-azu-ya nēlu ilu dika wormwood, Ọ di nkọ dika mma-agha iru abua. 5 Ukwu-ya abua nārida n'ọnwu; Ala-mọ ka nzọ-ukwu-ya nile nējidesi ike; 6 Ka i we ghara ime ka okporo-uzọ ndu di lari: Uzọ-ya nile emewo nkpatu, i gaghi-ama ha. 7 Ma ub͕u a, umum, gēnum nti, Unu esi-kwa-la n'okwu nile nke ọnum wezuga onwe-unu. 8 Me ka uzọ-gi di anya n'ebe ọ nọ, Abiaru-kwa-la ọnu-uzọ ulo-ya nso: 9 Ka i we ghara inye ndi ọzọ ebube-gi, Ka i we ghara kwa inye onye nēnweghi obi-ebere arọ-gi nile: 10 Ka afọ we ghara iju ndi nābughi ndi nke gi n'ume-gi; Ka ihe nile i dọb͕uru onwe-gi n'ọlu inweta we ghara kwa idi n'ulo onye nābughi nke gi; 11 I we sua udè n'ikpe-azu-gi, Mb͕e anu-aru-gi na aru-gi gāgwusi, 12 I we si, Le ka m'siworo kpọ idọ-aka-na-nti asì nke-uku, Ọ bu kwa iba-nba ka obim leliworo anya; 13 Egeghkwam nti n'olu ndi-ozizim, Ọ bughi kwa n'ebe ndi nēzím ihe nọ ka m'tọworo ntim n'ala! 14 Ọ fọduru ihe ntà ka m'nọzue n'ihe ọjọ nileN'etiti nkpọkọta na nzukọ ndi nkem. 15 Ṅua miri sitere n'olùlù nke aka gi, Na miri nērù erù site n'ime olùlù-miri nke aka gi. 16 Isi-iyi-gi, hà gāwasasi n'èzí? Ọ̀ bu n'amá ka iyi miri gāwasasi? 17 Ka ha diri nání gi onwe-gi, Ma ka ndi nābughi ndi nke gi ghara isoro gi nwe ha. 18 Ka isi-iyi-gi buru ihe agọziri agọzi; Ṅuri kwa ọṅu na nwunye i luru n'okorọbia. 19 Dika nne-ele nke nāhu n'anya na nne-ewu-ọhia mara nma, Ka ara-ya abua nēju gi afọ na mb͕e nile; Nání n'ihu-n'anya-ya ka i ganāwaghari mb͕e nile. 20 Ma n'ìhi gini ka i gēji nwayi nābughi nwunye-gi waghari, nwam? N'ìhi gini ka i gāb͕aku nwayi nābughi nwunye-gi obi? 21 N'ihi na n'iru anya Jehova ka uzọ nile nke madu di, Okporo-uzọ-ya nile ka Ọ nēme ka ha di lari. 22 Ajọ omume nile nke aka ya gānwude onye ahu nēmebi iwu, Agēji kwa udọ̀ nile nke nmehie-ya jidesie ya ike. 23 Onye ahu gānwu nānaraghi idọ-aka-na-nti; Ọ bu kwa n'iba-uba nke uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ ka ọ nāwaghari.

Ilu 6

1 Nwam, ọ buru na i nọworo madu-ibe-gi na mbe, Ọ buru na i narawo onye ala ọzọ n'aka ibu onye-mbe, 2 Ejiwo okwu nile nke ọnu-gi ma gi n'ọnyà, Ejiwo okwu nile nke ọnu-gi nwude gi. 3 Me nka ub͕u a, nwam, we naputa onwe-gi, N'ihi na i bàwo n'ọbu-aka nke madu-ibe-gi; Je, kwe ka azọtọ gi n'ukwu, riọchie madu-ibe-gi nti. 4 Enyela anya-gi abua ura, Enye-kwa-la mbubere-anya-gi irù-ura. 5 Naputa onwe-gi dika mb͕ada n'aka onye-ntá, Na dika nnunu n'aka osi-ọnyà. 6 Jekuru ndanda, onye-ume-ngwu; Le uzọ-ya nile, we mara ihe: 7 Nke nēnweghi onye-isi, ma-ọbu onye nēle anya n'ọlu, ma-ọbu onye nāchi achi, 8 Ma ọ nēdozi nri-ya na mb͕e okpom-ọku, Nēkpokọta kwa ihe-oriri-ya na mb͕e owuwe-ihe-ubi. 9 Rùe ole mb͕e ka i ganēdina ala, gi onye-ume-ngwu? Òle mb͕e ka i gēsi n'ura-gi bilie? 10 Nwa ura ntà, nwa irù-ura ntà, Nwa ikpakọba-aka ntà idina ala; 11 Ob͕eye-gi ewe bia dika onye nējeghari ipunara madu ihe, Ihe-ukọ-gi kwa dika nwoke ji ọta. 12 Madu nke jọb͕uru onwe-ya, onye nēme ajọ ihe; O ji ọnu nke nēkwu ihe b͕agọrọ ab͕agọ ejeghari; 13 O nēb͕u iku-anya-ya, o ji ukwu-ya abua ekwu okwu, O ji nkpisi-aka-ya nile nēzí ihe. 14 Ib͕akuta Chineke azu di n'obi-ya, ọ nēchèputa ihe ọjọ na mb͕e nile: Ọ nēzisa ise-okwu. 15 N'ihi nka nhuju-anya-ya gābia na mberede; N'otù ntabi-anya ka agētipia ya, ọ dighi kwa ngwọta di. 16 Ihe isi di nke Jehova kpọrọ asì; E, ihe asa di nke bu ihe-árú nke nkpuru-obi-Ya: 17 Anya di elu, na ire okwu-ugha, Na aka nāwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ; 18 Na obi nke nēchèputa èchìchè ajọ ihe, Na ukwu nēme ngwa ib͕aga n'ihe ọjọ; 19 Na onye-àmà okwu-ugha nke nēkupu okwu-ugha di iche iche dika ume, Na onye nēzisa ise-okwu n'etiti umu-nne. 20 Nwam, chebe ihe nna-gi nyere n'iwu, Arapu-kwa-la iwu nne-gi: 21 Hie ha n'obi-gi mb͕e nile, Ke ha n'olu-gi. 22 Mb͕e i nējeghari, ọ ganēdu gi; Mb͕e i nēdina ala, ọ ganēche gi; Mb͕e i teta-kwa-ra, nke ahu gēso gi kparia uka. 23 N'ihi na oriọna ka ihe ahu enyere n'iwu bu; iwu ahu bu kwa ìhè; Ọ bu kwa uzọ ndu ka iba-nba nile nke idọ-aka-na-nti bu: 24 Idebe gi ka i pua n'aka nwayi ọjọ, N'aka ire-utọ nke ire nwayi nābughi nwunye-gi. 25 Achọsila ima-nma-ya ike n'obi-gi; Ekwe-kwa-la ka o were gi na mbubere-anya-ya. 26 N'ihi na ọ bu n'ihi nwayi nākwa iko ka eji eme ka nwoke biarue nání otù ob͕e achicha: Nwunye nwoke ọzọ nāchu kwa ntá ndu di oké ọnu-ahia. 27 Madu, ọ̀ gāguru ọku tiye n'uwe obi-ya, Ma uwe-ya agaghi-ere ọku? 28 Ma-ọbu madu, ọ̀ gēje ije n'elu icheku-ọku, Ma ọku agaghi-aru ya n'ukwu-ya abua? 29 Otú a ka onye nābakuru nwunye madu-ibe-ya di; Agaghi-agu onye ọ bula nke nēmetu nwayi ahu aka n'onye nēmeghi ihe ọjọ. 30 Madu adighi-eleda onye-ori anya, mb͕e o nēzu oriImeju nkpuru-obi-ya mb͕e agu nāgu ya: 31 Ma asi na achọta ya, ọ gākwughachi okpukpu asa; Àkù nile nke ulo-ya ka ọ gēnye. 32 Onye nākwa nwayi iko, obi amam-ihe kọrọ ya: Onye nēmebi nkpuru-obi nke aka ya ka onye nēme ya bu. 33 Ọnyá-ntiputa na nlelì ka ọ gāhu; Ita-uta-ya kwa, agaghi-ehichapu ya. 34 N'ihi na ekworo bu ọnuma nke nwoke; Ọ gaghi-enwe ọmiko n'ubọchi ọ́bọ̀. 35 Ọ gaghi-ahu ihe-ikpuchi-nmehie ọ bula iru ọma; Ọ gaghi-ekwe kwa, mb͕e i gēme ka ihe-iri-ngo ba uba.

Ilu 7

1 Nwam, debe okwu-ọnum nile, Zobe ihe nile m'nyere n'iwu n'ebe i nọ. 2 Debe ihe nile m'nyere n'iwu, we di ndu, Debe kwa iwum dika nwa-anya nke anya-gi. 3 Ke ha na nkpisi-aka-gi nile; De ha n'elu mbadamba nkume, bú obi-gi. 4 Si amam-ihe, Nwa-nnem nwanyi ka i bu; Kpọ kwa nghọta nwanyi i mara nke-ọma: 5 Ka ha we debe gi ka i pua n'aka nwanyi nābughi nwunye-gi, N'aka nwanyi nābughi nwunye-gi nke nēkwu okwu ire-utọ. 6 N'ihi na na window nke ulomN'oghere-inara-ifufem ka m'lepuru anya; 7 M'we hu n'etiti ndi nēnweghi uche, M'mata n'etiti umu-ndikom, Otù nwa-okorọbia nke obi amam-ihe kọrọ, 8 Ka ọ nāgabiga n'amá na nso nkuku nwanyi ahu, Ọ bu kwa n'uzọ ulo-ya ka ọ nāzọ ije; 9 Na chi-ojiji, n'anyasi nke ubọchi, Nime nb͕achi nke abali na ọchichiri. 10 Ma, le, otù nwanyi zutere yaYiri uwe nke nwanyi nākwa iko, ọ bu kwa onye echeworo obi-ya. 11 Onye nēme nkpọtu ka ọ bu, buru kwa onye nēwezuga onwe-ya; Ọ bughi n'ulo-ya ka ukwu-ya nānọ: 12 Ub͕u a n'èzí ka ọ nọ, ub͕u a ọ bu n'amá nile, Ọ bu kwa na nso nkuku nile ọ bula ka ọ nēche anwu. 13 Nwanyi ahu we jide ya aka, sutu kwa ya ọnu, Were iru ihere nādighi si ya: 14 Ihe àjà nile nke àjà-udo di n'akam; Ta ka m'kwughachiworo ihe nile m'kwere na nkwa. 15 N'ihi nka ka m'putara izute gi, Ichọsi iru-gi ike, m'we chọputa gi. 16 Ákwà-nb͕abá mara nma ka m'b͕abáworo n'ihe m'ji edina, Bú ákwà turu agwa nke ogho Ijipt. 17 Ewerewom myrrh na aloes na cinnamonFesa ihe-ndinam. 18 Bia, ka afọ jubiga ayi ókè n'ikwa-iko rue ututu; Ka ayi me ka obi tọ ayi utọ n'ihu-n'anya nile. 19 N'ihi na dim anọghi n'ulo, O jewo ije di anya: 20 Ọ werewo akpa ego n'aka-ya; N'ubọchi ọnwa-ndọzu ka ọ gālata. 21 O were ọtutu urà-ya wezuga nwa-okorọbia ahu ka ọ ba n'ulo-ya, O were okwu ire-utọ nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya nufue ya. 22 Nwa-okorọbia ahu nējeso ya na mberede, Dika ehi si abia n'ob͕ub͕u-ya, Ma-ọbu dika nkpọrọ-ukwu si abia n'idọ-aka-na-nti nke onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya; 23 Rue mb͕e àkú gēji b͕apue imeju-ya; Dika nnunu si eme ngwa ibà n'ib͕udu, Ma ọ maghi na imegide ndu-ya ka ọ bu. 24 Ma ub͕u a, umum, genum nti, Tọ-kwa-nu nti n'ala n'okwu nile nke ọnum. 25 Ekwela ka obi-gi wezuga onwe-ya ba n'uzọ nile nke nwanyi ahu, Akpafula n'okporo-uzọ-ya nile. 26 N'ihi na ọ di ọtutu ndi emeruru aru ka o meworo ka ha da: E, ndi nwere ume ka ndi-ya nile eb͕uru eb͕u bu. 27 Uzọ nile nke ala-mọ ka ulo-ya bu, Nāridaru ime-ulo nke ọnwu.

Ilu 8

1 Amam-ihe, ọ̀ dighi-akpọ òkù? Nghọta kwa, ọ̀ dighi-eme ka olu-ya da udà? 2 N'elu ebe nile di elu n'akuku uzọ, N'ab͕ata uzọ nile, ka O guzoworo onwe-ya; 3 N'akuku ọnu-uzọ-ama nile, n'ọnu amá obodo, Na nbata ọnu-uzọ nile, ka ọ nētisi nkpu ike, si, 4 Ọ bu unu, madu, ka m'nākpọku; Olum nādaku kwa umu madu. 5 Unu ndi nēnweghi uche, ghọtanu ezi uche; Unu ndi-nzuzu kwa, menu ka obi-unu ghọta ihe. 6 Nurunu, n'ihi na isi ihe di iche iche ka m'nēkwu; Nsaghe eb͕ub͕ere-ọnum gābu kwa ihe di iche iche ziri ezi. 7 N'ihi na ezi-okwu ka okpo-ọnum nēkwu dika onye nātughari uche; Ọzọ, ihe-árú nke eb͕ub͕ere-ọnum ka nmebi-iwu bu. 8 N'ezi omume ka okwu nile nke ọnum di; Ọ dighi ihe nēzighi ezi ma-ọbu ihe b͕agọrọ ab͕agọ di nime ha. 9 Ha nile putara ìhè n'ebe onye-nghọta nọ, Ha zi-kwa-ra ezi n'ebe ndi nāchọta ihe-ọmuma nọ. 10 Nara idọ-aka-na-ntim, anara-kwa-la ọla-ọcha; Nara kwa ihe-ọmuma kari ọla-edo ọma arọputara arọputa. 11 N'ihi na amam-ihe di nma kari ruby; Ihe nile kwa nke nātọ madu utọ, ha agaghi-ara ka ya. 12 Mu onwem, bú amam-ihe, emewo ezi uche ebe-obibim, Ọ bu kwa ọmuma ihe-ìzùzù di iche iche ka m'nāchọputa. 13 Egwu Jehova bu ikpọ ihe ọjọ asì: Npako, na nganga, na uzo ọjọ, Na ọnu nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu, ka m'kpọworo asì. 14 Mu nwe ndum-ọdu na nzube-ihe: Mu onwem bu nghọta; mu nwe idi-ike. 15 Mu ka ndi-eze ji abu eze, Ọ bu kwa mu ka ndi nāchi achi ji enye ukpuru, bú ezi omume. 16 Mu ka ndi-isi ji abu ndi-isi, Ha na ndi amara aha-ha, bú ndi-ikpe nile nke uwa. 17 Mu onwem nāhu ndi ahu n'anya, bú ndi nāhum n'anya; Ọ bu kwa ndi nāchọsim ike gāchọtam. 18 Àkù na nsọpuru di n'akam; E, àkù nke nādigide na ezi omume. 19 Nkpurum di nma kari ọla-edo ọma, e, kari ọla-edo anuchara anucha; Ihe-omumem di kwa nma kari ọla-ọcha arọputara arọputa. 20 N'uzọ ezi omume ka m'nēje ije, N'etiti okporo-uzọ nile nke ikpé: 21 Ime ka ndi nāhum n'anya keta ihe di adi, Ka m'we meju kwa ulo-àkù nile ha. 22 Jehova nwerem na nmalite uzọ-Ya, Tutu ọlu-Ya nile site na mb͕e ahu. 23 Site na mb͕e ebighi-ebi ka emerem ka m'guzosie ike, site n'isi-mbu, Tutu uwa adi. 24 Mb͕e ọ dighi ob͕u-miri ọ bula di, amuputaram; Mb͕e ọ dighi isi-iyi ọ bula di nke juputara na miri. 25 Tutu eme ka ntọ-ala ugwu nile bamie n'ala, Tutu ugwu ntà nile adi ka amuputaram: 26 Mb͕e Ọ kēmeghi uwa, ma-ọbu azu obodo, Ma-ọbu nmalite ájá nke elu-uwa dum madu bi. 27 Mb͕e O doziri elu-igwe, n'ebe ahu ka m'nọ: Mb͕e O nyere ukpuru, si, Ka ihe b͕ara buruburu dikwasi n'iru ob͕u-miri: 28 Mb͕e Ọ mere ka mbara-ígwé sie ike n'elu: Mb͕e emere ka isi-iyi nile nke ob͕u-miri di ike: 29 Mb͕e O ji kpara oké osimiri ókè-ya, Ka miri we ghara igabiga okwu-ọnu-Ya: Mb͕e O ji turu ntọ-ala uwa ukpuru: 30 Anọkwam n'akuku Ya, dika onye-ọ̀kà: M'we buru ihe nātọ Ya utọ kwa-ubọchi, Nēgwuri egwú n'iru Ya mb͕e nile; 31 Nēgwuri egwú n'elu-uwa dum madu bi n'uwa-Ya; Ihe nātọm utọ di kwa n'ebe umu madu nọ. 32 Ma ub͕u a, umum, genum nti: N'ihi na ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nēdebe uzọm nile bu. 33 Nurunu idọ-aka-na-nti, we mara ihe, Unu eze-kwa-la ya ndu. 34 Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu nke nēgem nti bu, N'imu anya n'akuku ibo-ọnu-uzọm nile kwa-ubọchi, Niche nche n'akuku-ọnu-uzọ nke ọnu-uzọm nile. 35 N'ihi na onye nāchọtam achọtawo ndu, Ọ gēnweputa kwa n'aka Jehova na ihe-ya gātọ Ya utọ. 36 Ma onye nēmehie megidem nēme nkpuru-obi-ya ihe-ike: Ndi nile nke nākpọm asì nāhu ọnwu n'anya.

Ilu 9

1 Amam-ihe ewuwo ulo-ya, Ọ waputawo ogidi asa ya: 2 O b͕uwo anu-ob͕ub͕u-ya; ọ gwawo manya-vine-ya agwa; O dowo kwa table-ya n'usoro. 3 O zipuwo umu-ab͕ọghọ-ya, ọ nākpọ òkùN'elu ebe nile di elu nke obodo, si, 4 Onye ọ bula nēnweghi uche, ya wezuga onwe-ya bata n'ebe a: Onye obi amam-ihe kọrọ, amam-ihe asiwo ya, 5 Bianu, rienu nrim ufọdu, Ṅu-kwa-nu manya-vine ufọdu nke m'gwaworo agwa. 6 Rapunu amaghi-ihe, unu ndi nēnweghi uche, we di ndu; Ga-kwa-nu n'iru n'uzọ nghọta. 7 Onye nādọ onye nākwa emò aka na nti nēwetara onwe-ya nlelì: Ọzọ, onye nābara onye nēmebi iwu nba nēwetara onwe-ya ọlu-ya. 8 Abarala onye nākwa emò nba, ka o we ghara ikpọ gi asì: Bara onye mara ihe nba, ọ gāhu kwa gi n'anya. 9 Nye onye mara ihe nmuta, ọ gāmara kwa ihe kari: Me ka onye ezi omume mara ihe, ọ gātukwasi ihe-nmuta n'amam-ihe-ya. 10 Nmalite amam-ihe ka egwu Jehova bu: Ihe-ọmuma nke Onye Nsọ bu kwa nghọta. 11 N'ihi na site na mu ka ubọchi-gi gāba uba, Agātukwasi-kwa-ra gi arọ ndu. 12 Ọ buru na i mara ihe, i maworo onwe-gi ihe: Ọ buru kwa na i kwa emò, nání gi gēbu ya. 13 Nwanyi nzuzu nēme nkpọtu; Onye nēnweghi uche ka ọ bu, ọ maghi kwa ihe ọ bula. 14 Ọ nānọdu kwa n'ọnu-uzọ ulo-ya, N'elu oche n'ebe nile di elu nke obodo, 15 Ikpọ ndi nāgabiga n'uzọ òkù, Bú ndi nāgazi agazi n'okporo-uzọ-ha, 16 Onye ọ bula nēnweghi uche, ya wezuga onwe-ya bata n'ebe a: Ọzọ, onye obi amam-ihe kọrọ, nwanyi ahu asiwo ya, 17 Miri ezutara ezuta nātọ utọ, Nri eriri na nzuzo di utọ. 18 Ma nwoke ahu amaghi na ndi nādighi ndu nọ n'ebe ahu; Na ọ bu n'ebe nile miri emi nke ala-mọ ka ndi ọ kpọrọ nọ.

Ilu 10

1 Ilu di iche iche nke Solomon. Nwa nke mara ihe nēme ka nna-ya ṅuria: Ma nwa di nzuzu bu iru-újú nne-ya. 2 Àkù nke nmebi-iwu adighi-aba urù: Ma ezi omume nānaputa n'ọnwu. 3 Jehova agaghi-ekwe ka agu gub͕ue nkpuru-obi onye ezi omume: Ma ọchichọ nke ndi nēmebi iwu nāchọsi ike ka Ọ nākwapu. 4 Ob͕eye ka onye ji ọbu-aka ume-ngwu alu ọlu gābu: Ma aka ndi di nkọ nēme ọgaranya. 5 Onye nēkpokọta na mb͕e okpom-ọku bu nwa nēnwe uche: Ma onye nāraru ura n'owuwe-ihe-ubi bu nwa nēweta ihere. 6 Ngọzi nile nādiri isi onye ezi omume: Ma ihe-ike nēkpuchi ọnu ndi nēmebi iwu. 7 Ncheta anēcheta onye ezi omume bu ihe-ngọzi: Ma aha ndi nēmebi iwu gēre ure. 8 Ndi obi-ha mara ihe gānata ihe enyere n'iwu: Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka agākwatu. 9 Onye nēje ije n'izu-okè nēje na ntukwasi-obi: Ma onye nēme ka uzọ-ya nile b͕agọ ab͕agọ, agāmara ya. 10 Onye nēb͕u iku-anya nēnye ihe-nwuta: Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka agākwatu. 11 Isi-iyi nke ndu ka ọnu onye ezi omume bu: Ma ime-ihe-ike nēkpuchi ọnu ndi nēmebi iwu. 12 Ikpọ-asì nākpọte ise-okwu di iche iche: Ma njehie nile ka ihu-n'anya nēkpuchi. 13 N'eb͕ub͕ere-ọnu nke onye nāghọta ihe ka anāchọta amam-ihe: Ma nkpa-n'aka diri azu onye obi amam-ihe kọrọ. 14 Ndi mara ihe nākpakọba ihe-ọmuma: Ma ọnu onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya bu nbibi di nso. 15 Àkù nke ọgaranya bu obodo-ya siri ike: Nbibi nke ndi nēnweghi ike bu ob͕eye ha bu. 16 Ọlu onye ezi omume nēdubà na ndu; Ihe-omume nke onye nēmebi iwu nēdubà na nmehie. 17 Uzọ iru na ndu ka onye nēdebe idọ-aka-na-nti bu: Ma onye nārapu iba-nba nēme ka madu kpafue. 18 Onye nēkpuchi ikpọ-asì nwere eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha; Ọzọ, onye nēme ka akukọ ọjọ puta, onye ahu bu onye-nzuzu. 19 N'ọtutu okwu njehie adighi-akwusi: Ma onye nēb͕ochi eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua bu onye nwere uche. 20 Ọla-ọcha arọputara arọputa ka ire onye ezi omume bu: Obi ndi nēmebi iwu di ka ihe ntà. 21 Eb͕ub͕ere-ọnu abua nke onye ezi omume nāzù ọtutu madu: Ma ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha nānwu n'ihi na obi amam-ihe kọrọ ha. 22 Ngọzi Jehova, nke ahu nēme madu ọgaranya, Ọ dighi-atukwasi kwa ya ihe-nwuta. 23 Ọ diri onye-nzuzu dika igwuri-egwú, bú ime ihe-nzube ọjọ: Otú a ka amam-ihe di-kwa-ra onye-nghọta. 24 Ihe onye nēmebi iwu nātu ujọ ya, nke ahu gābiakute ya: Ma ihe ndi ezi omume nāchọsi ike ka agēnye ha. 25 Mb͕e oké ifufe nēfebiga, onye nēmebi iwu anọghi kwa: Ma onye ezi omume bu ntọ-ala ebighi-ebi. 26 Dika manya b͕ara uka si adi n'ebe ezé di, na dika anwuru-ọku si adi n'ebe anya di, Otú a ka onye-ume-ngwu nādi n'ebe ndi nēzì ya ozi nọ. 27 Egwu Jehova nātukwasi ubọchi na ndu madu: Ma arọ nile nke ndi nēmebi iwu gādi nkpunkpu. 28 Nchere ndi ezi omume gābu ọṅù: Ma olile-anya ndi nēmebi iwu gāla n'iyì. 29 Ebe siri ike n'ebe onye zuru okè nọ ka uzọ Jehova bu; Ma ọ bu nbibi n'ebe ndi nālu ajọ ihe nọ. 30 Agaghi-ewezuga onye ezi omume n'ọnọdu-ya rue mb͕e ebighi-ebi: Ma ndi nēmebi iwu agaghi-ebi n'uwa. 31 Ọnu onye ezi omume nāmi amam-ihe dika nkpuru: Ma ire nke nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu, agēbipu ya. 32 Eb͕ub͕ere-ọnu abua nke onye ezi omume mara ihe nātọ utọ: Ma ọnu ndi nēmebi iwu nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu.

Ilu 11

1 Ihe-osìsì aghughọ bu ihe-árú n'anya Jehova: Ma nkume-isì-ihe zuru ezu bu ihe nātọ Ya utọ. 2 Nganga bia, nlelì abia kwa: Ma n'ebe ndi di ume-ala n'obi nọ ka amam-ihe di. 3 Izu-okè nke ndi ziri ezi nēdu ha: Ma omume b͕agọrọ nke ndi nāghọb͕u aghọb͕u gēmebi ha. 4 Àkù adighi-aba urù n'ubọchi nke nrubiga-ókè nke iwe: Ma ezi omume nānaputa n'ọnwu. 5 Ezi omume nke onye zuru okè gēme ka uzọ-ya zie ezi: Ma nmebi-iwu nke aka ya ka onye nēmebi iwu gēji da. 6 Ezi omume nke ndi ziri ezi gānaputa ha: Ma n'ọchichọ nke ha nāchọsi ike ka agānwude ndi nāghọb͕u aghọb͕u. 7 Mb͕e madu nke nēmebi iwu nwuru, olile-anya-ya gāla n'iyì: Ọzọ, nchere nke ajọ ihe nile alawo n'iyì. 8 Adọputawo onye ezi omume n'ahuhu, Onye nēmebi iwu ba n'ọnọdu ya. 9 Ọnu-ya ka onye emeruru emeru ji ebibi madu-ibe-ya: Ma ihe-ọmuma ka agēji dọputa ndi ezi omume. 10 N'ọdi-nma nke ndi ezi omume obi ndi obodo-ha nātọ ha utọ: Ọzọ, mb͕e ndi nēmebi iwu nāla n'iyì, iti-nkpu-ọṅù di. 11 Eji ngọzi nke ndi ziri ezi bulie obodo: Ma eji ọnu ndi nēmebi iwu akwada ya. 12 Onye nēleda madu-ibe-ya anya, obi amam-ihe kọrọ ya: Ma onye-nghọta nāb͕a nkiti. 13 Onye nējeghari dika onye nāb͕a àmà ọjọ nēkpughe ìzù nzuzo: Ma onye mọ-ya kwesiri ntukwasi-obi nēkpuchi okwu. 14 Mb͕e ọ nādighi ezi ndum-ọdu ọ bula di, ndi ahu gāda: Ma nzọputa di n'ọtutu ndi nādu ọdu. 15 Aghaghi imejọ madu, mb͕e ọ nọworo onye ala ọzọ na mbe: Ma onye nākpọ ndi nānara madu n'aka ibu ndi-mbe asì, ọ nọ na ntukwasi-obi. 16 Nwayi amara nējidesi nsọpuru ike: Ndi nēme ka madu ma jijiji nējidesi kwa àkù ike. 17 Onye nēmeso nkpuru-obi-ya ezi ihe ka onye-ebere bu: Ma onye nēmekpa anu-aru nke aka ya aru ka onye nēnweghi obi-ebere bu. 18 Onye nēmebi iwu nāluta ego-ọlu okwu-ugha: Ma onye nāgha ezi omume dika nkpuru nāluta ugwọ-ọlu kwesiri ntukwasi-obi. 19 Onye nēguzosi ike n'ezi omume gēru na ndu: Ma onye nāb͕aso ihe ọjọ gēru n'ọnwu nke aka ya. 20 Ihe-árú n'anya Jehova ka ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'obi bu: Ma ihe nātọ Ya utọ ka ndi zuru okè n'uzọ-ha bu. 21 Site n'aka rue aka, agaghi-agu onye ọjọ n'onye nēmeghi ihe ọjọ: Ma nkpuru ndi ezi omume gēwepuga onwe-ha. 22 Dika nb͕a-aka ọla-edo n'imi ezì, Otú a ka nwanyi mara nma nke nēsi n'ezi uche wezuga onwe-ya di. 23 Ihe ndi ezi omume nāchọsi ike bu nání ezi ihe: Ma olile-anya nke ndi nēmebi iwu bu nrubiga-ókè nke iwe. 24 O nwere onye nāghasa aghasa, ma anọ̀ nātukwasiri ya ihe kari; O nwe-kwa-ra onye nēb͕ochi eb͕ochi kari nke ziri ezi, ma ọ nēdubà nání n'ikọ-ukọ. 25 Nkpuru-obi nke nāgọzi agọzi ka agēme ka ọ ma abuba: Ọzọ, onye nēme ka ndi ọzọ ṅujue afọ, agēme kwa ka ya onwe-ya ṅujue afọ. 26 Onye nēb͕uchi ọka, ọra madu gākọcha ya: Ma ngọzi n'isi onye nēre ya. 27 Onye nāchọsi ezi ihe ike nāchọ ka ihe-ya nātọ Chineke utọ: Ma onye nāchọ ihe ọjọ, ihe ahu gābiakute ya. 28 Onye nātukwasi obi n'àkù-ya, onye ahu gāda: Ma dika akwukwọ ndu ka ndi ezi omume gēpú. 29 Onye nēmekpa èzí-na-ulo-ya aru gēketa ifufe: Orù ka onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya gābu-kwa-ra onye obi-ya mara ihe. 30 Nkpuru onye ezi omume nāmi bu osisi nēnye ndu; Onye nēnwetara Chineke nkpuru-obi madu ka onye mara ihe bu. 31 Le, agākwughachi onye ezi omume ugwọ n'uwa: Àgēsi kwa aṅa ghara ikwughachi onye nēmebi iwu na onye-nmehie?

Ilu 12

1 Onye nāhu idọ-aka-na-nti n'anya nāhu ihe-ọmuma n'anya: Ma onye nākpọ iba-nba asì bu anu-ọhia. 2 Ezi madu gēnweputa n'aka Jehova na ihe-ya gātọ Ya utọ: Ma onye nzube ọjọ ka Ọ gāma ikpe. 3 Madu agaghi-eguzosi ike site na nmebi-iwu: Ma nkpọrọgwu ndi ezi omume, agaghi-eropu ya. 4 Nwanyi nke nējide onwe-ya nke-ọma bu okpu-eze di-ya: Ma ọ di ka ire-ure n'ọkpukpu di-ya, bú nwayi nēweta ihere. 5 Èchìchè nile nke ndi ezi omume bu ezi ikpé: Ma ndum-ọdu nile nke ndi nēmebi iwu bu aghughọ. 6 Okwu nile nke ndi nēmebi iwu bu iche anwu ọbara: Ma ọnu ndi ziri ezi gānaputa ha. 7 Asi na ekpùe ndi nēmebi iwu iru, ha anọghi kwa: Ma ulo ndi ezi omume gēguzo. 8 Dika ezi uche-ya si di ka agēto onye ọ bula: Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'obi gāghọ onye anēleda. 9 Ọ di nma, bú onye anēlelì, ma o nwere orù, Kari onye nāsọpuru onwe-ya, ma nri kọrọ ya. 10 Onye ezi omume mara ndu anu-ulo-ya: Ma obi-ebere nile nke ndi nēmebi iwu bu enweghi-obi-ebere. 11 Onye nālu ala-ubi-ya, afọ gēju ya na nri: Ma onye nāb͕aso ihe-efu di iche iche, obi amam-ihe kọrọ ya. 12 Onye nēmebi iwu achọsiwo ọnyà ndi ọjọ ike: Ma nkpọrọgwu ndi ezi omume nāmi nkpuru. 13 Na njehie nke eb͕ub͕ere-ọnu ka ọnyà onye ọjọ di: Ma onye ezi omume gēsi n'ahuhu puta. 14 Site na nkpuru nke ọnu onwe-ya ka afọ gēju onye ọ bula n'ezi ihe: Ọzọ, nmeso aka madu nke ọ nēmeso madu-ibe-ya, nke ahu ka agēnyeghachi ya. 15 Uzọ nke onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ziri ezi n'anya ya onwe-ya: Ma onye nēge nti ndum-ọdu ka onye mara ihe bu. 16 Onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya, n'otù ubọchi ahu ka anāmara iwe anākpasu ya: Ma onye nēkpuchi nlelì ka onye nwere ezi uche bu. 17 Onye nēkupu ikwesi-ntukwasi-obi dika ume nēgosi ezi omume, Ma onye-àmà okwu-ugha nēgosi aghughọ. 18 O nwere onye nēkwu okwu nēchèghi echè dika ndupú nke mma-agha: Ma ire ndi mara ihe bu ihe nāgwọ madu. 19 Eb͕ub͕ere-ọnu ezi-okwu gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi: Ma nání rue otù ntabi-anya ka ire okwu-ugha di. 20 Aghughọ di n'obi ndi nēchèputa ihe ọjọ: Ma ndi nādu ọdu udo nwere ọṅù. 21 Ọ dighi ajọ ihe ọ bula gādakwasi onye ezi omume: Ma ndi nēmebi iwu ejuputawo n'ihe ọjọ. 22 Ihe-árú n'anya Jehova ka eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha bu: Ma ndi ji ezi-okwu eme ihe bu ndi ihe-ha nātọ Ya utọ. 23 Madu nke nwere ezi uche nēkpuchi ihe-ọmuma: Ma obi ndi-nzuzu nākpọsa uche b͕agọrọ ab͕agọ. 24 Aka ndi di nkọ gāchi achi: Ma onye-ume-ngwu gādi n'usu ndi nēfè òfùfè. 25 Ncheb͕u n'obi madu nēme ka obi ruru ala; Ma okwu ọma nēme ka ọ ṅuria. 26 Onye ezi omume nēgosi madu-ibe-ya uzọ: Ma uzọ ndi nēmebi iwu nēme ka ha kpafue. 27 Onye-ume-ngwu adighi-aru anu ọ chutara na ntá: Ma àkù madu nke di oké ọnu-ahia diri onye di nkọ. 28 N'uzọ ezi omume ka ndu di; Ọzọ, n'uzọ nke okporo-uzọ-ya, ọ dighi ọnwu di ya.

Ilu 13

1 Nwa nke mara ihe nānu idọ-aka-na-nti nna-ya: Ma onye nākwa emò anughi ibasi-nba-ike. 2 Site na nkpuru nke ọnu-ya ka onye ọ bula gēri ezi ihe: Ma nkpuru-obi ndi nāghọb͕u aghọb͕u gēri ime-ihe-ike. 3 Onye nēche ọnu-ya nche nēdebe ndu-ya: Ma onye nāsaghepu eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua, nbibi gādiri ya. 4 Ọ nāchọsi ike, ma ọ dighi ihe o nwere, bú nkpuru-obi onye-ume-ngwu: Ma nkpuru-obi nke ndi di nkọ, agēme ya ka ọ ma abuba. 5 Okwu-ugha ka onye ezi omume nākpọ asì: Ma onye nēmebi iwu nēsì ísì, we nwe iru-ihere. 6 Ezi omume nēchebe onye zuru okè n'uzọ: Ma nmebi-iwu nēme ka onye-nmehie kpùe iru. 7 O nwere onye nēme onwe-ya ọgaranya, ma ọ dighi ihe ọ bula o nwere: O nwere onye nēme onwe-ya ob͕eye, ma àkù-ya bara uba. 8 Ihe-nb͕aputa nke ndu onye ọ bula bu àkù-ya: Ma ob͕eye anughi ibasi-nba-ike. 9 Ìhè ndi ezi omume nāṅuri ọṅu: Ma oriọna ndi nēmebi iwu gānyu. 10 Nání na nganga ka ilu-ọ̀gù nāputa: Ma n'aka ndi aduworo ọdu ka amam-ihe di. 11 Àkù nke sitere n'ihe-efu gēbilata: Ma onye ji aka-ya achikọta ihe gāba uba. 12 Nchere anēchere ogologo mb͕e di anya nēme ka obi nāria ọria: Ma osisi nke nēnye ndu ka ihe anāchọsi ike bu, mb͕e ọ biaruworo. 13 Onye nēleda okwu Chineke anya nēmebi onwe-ya: Ma onye nātu egwu ihe enyere n'iwu, onye ahu ka agākwughachi ugwọ. 14 Iwu onye mara ihe bu isi-iyi nke ndu, Isi n'ọnyà nile nke ọnwu wezuga onwe-gi. 15 Ezi uche nēnye amara: Ma uzọ ndi-nghọb͕u bu nání nkume. 16 Onye ọ bula nke nwere ezi uche ji ihe-ọmuma alu ọlu: Ma onye-nzuzu nāb͕asa uche b͕agọrọ ab͕agọ. 17 Onye-ozi nke nēmebi iwu nādabà n'ihe ọjọ: Ma ukọ̀ nke kwesiri ntukwasi-obi bu ihe nāgwọ madu. 18 Inọ-n'ob͕eye na nlelì gādiri onye nēzere idọ-aka-na-nti: Ma onye nāriba iba-nba ama ka agāsọpuru. 19 Mb͕e ihe anāchọsi ike mere ọ nātọ nkpuru-obi utọ: Ma ọ bu ihe-árú n'anya ndi-nzuzu isi n'ihe ọjọ wezuga onwe-ha. 20 Nējeso ndi mara ihe, i gāma kwa ihe: Ma eyì ndi-nzuzu ka agēmejọ. 21 Ndi-nmehie ka ihe ọjọ nāchu: Ma ndi ezi omume ka agākwughachi ezi ihe. 22 Ezi madu nēme ka umu umu-ya keta ihe-ya; Ma ihe anākpakọbara onye ezi omume ka àkù onye-nmehie bu. 23 Ọtutu ihe-oriri di n'ubi ndi-ob͕eye: Ma o nwere nke anēkpochapu site n'ikpe nābughi ikpe. 24 Onye nēb͕ochi nkpa-n'aka-ya nākpọ nwa-ya asì: Ma onye nāhu ya n'anya nādọsi ya aka na nti ike. 25 Onye ezi omume nēri ihe rue mb͕e afọ juru nkpuru-obi-ya: Ma afọ ndi nēmebi iwu, ihe nākọ ya.

Ilu 14

1 Nwanyi ọ bula nke mara ihe ewuwo ulo-ya: Ma nwanyi nke b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ji aka-ya abua akwada ya. 2 Onye nēje ije n'izi-ezi-ya nātu egwu Jehova: Ma onye nēsihie n'uzọ-ya nile nēleda Ya anya. 3 N'ọnu onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ka ome npako di: Ma eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi mara ihe gēdebe ha. 4 Mb͕e ehi nādighi, ulo anāzù ehi nādi ọcha: Ma ihe-omume riri nne nēsite n'ike ehi. 5 Onye-àmà nke kwesiri ntukwasi-obi adighi-ekwu okwu-ugha: Ma onye-àmà okwu-ugha nēkupu okwu-ugha dika ume. 6 Onye nākwa emò achọwo amam-ihe, ma ọ hughi ya: Ma ihe-ọmuma diri onye-nghọta nfe. 7 Je na ncherita-iru onye-nzuzu, I gaghi-amata kwa eb͕ub͕ere-ọnu ihe-ọmuma n'aru ya. 8 Amam-ihe onye nwere ezi uche bu ighọta uzọ-ya: Ma uche b͕agọrọ ab͕agọ nke ndi-nzuzu bu aghughọ. 9 Ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha, ikpe-ọmuma nākwa emò ha: Ma n'etiti ndi ziri ezi ka ihe nātọ Chineke utọ di. 10 Obi mara ilu nke aka ya; Ọ bu kwa n'ọṅù-ya ka onye nke nābughi nke ya nādighi-agwakọta onwe-ya. 11 Ulo nke ndi nēmebi iwu, agēme ka ọ tọb͕orọ n'efu: Ma ulo-ikwū nke ndi ziri ezi gāma akwukwọ dika ihe akuku aku. 12 Uzọ di nke ziri ezi n'iru madu, Ma nsọtu-ya bu uzọ nile nke ọnwu. 13 Ọbuná n'ọchì ka ihe nēb͕u obi nb͕u; Ọzọ, ikpe-azu ọṅù bu iru-újú. 14 Site n'uzọ nile nke aka ya ka afọ gēju onye laghachiworo azu n'obi: Ma ọ bu site n'onwe-ya ka afọ gēju ezi madu. 15 Onye nēnweghi uche nēkwere okwu nile ọ bula: Ma onye nwere ezi uche nāghọta ije-ukwu-ya. 16 Onye mara ihe nātu egwu, we si n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya: Ma onye-nzuzu nēwebiga iwe ókè, we nātukwasi obi. 17 Onye nēwe iwe ọsọsọ gēme ihe nke uche b͕agọrọ ab͕agọ: Ọzọ, onye ọbula nke nēzu nzube ọjọ di iche iche, anākpọ ya asì. 18 Ndi nēnweghi uche eketawo uche b͕agọrọ ab͕agọ: Ma ndi nwere ezi uche ka anēkpube ihe-ọmuma n'isi. 19 Ndi ọjọ erudawo ala n'iru ndi ezi madu; Ndi nēmebi iwu kwa n'ọnu-uzọ-ama nile nke onye ezi omume. 20 Ọbuná onye-ab͕ata-obi nke ob͕eye nākpọ ya asì: Ma ndi nāhu ọgaranya n'anya di ọtutu. 21 Onye nēleda madu-ibe-ya anya nēmehie: Ma onye nēmere ndi ewedara n'ala amara, onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu. 22 Hà adighi-akpafu, bú ndi nēchèputa ihe ọjọ? Ma ebere na ezi-okwu gādiri ndi nēchèputa ezi ihe. 23 Na ndọb͕u nile nke madu nādọb͕u onwe-ya n'ọlu urù di ya: Ma okwu eb͕ub͕ere-ọnu nēdubà nání n'ihe-ikọ-ukọ. 24 Okpu-eze nke ndi mara ihe bu àkù-ha: Ma uche b͕agọrọ ab͕agọ nke ndi-nzuzu bu nání uche b͕agọrọ ab͕agọ. 25 Onye nānaputa nkpuru-obi di iche iche ka onye-àmà nke nēkwu ezi-okwu bu: Ma onye nēkupu ọtutu okwu-ugha dika ume nāghọ aghughọ. 26 N'egwu Jehova ka ntukwasi-obi siri ike di: Umu-Ya gēnwe kwa ebe-nb͕abà. 27 Egwu Jehova bu isi-iyi nke ndu, Isi n'ọnyà nile nke ọnwu wezuga onwe-gi. 28 N'uba nke ndi ọ bula ka ima-nma eze di: Ma n'ukọ mba ọ bula ka nbibi onye-isi di. 29 Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ nwere ọtutu nghọta: Ma onye nwere obi ọku nēbuli uche b͕agọrọ ab͕agọ. 30 Ndu nke anu-aru ka obi agwọrọ ọria-ya bu: Ma ire-ure nke ọkpukpu nile ka ekworo bu. 31 Onye nēmeb͕u onye nēnweghi ike nāta Onye kèworo ya uta: Ma onye nāsọpuru Ya ka onye nēme ob͕eye amara bu. 32 Anenupu onye nēmebi iwu n'ihe ọjọ ya: Ma onye nwere ebe-nb͕abà n'ọnwu-ya ka onye ezi omume bu. 33 N'obi onye-nghọta ka amam-ihe nānọgide: Ma n'etiti ndi-nzuzu ka ọ nēme ka amara ya. 34 Ezi omume nēbuli mba: Ma ihe-ihere nke ndi nile di iche iche ka nmehie bu. 35 Ihe orù nwere uche nātọ eze utọ: Ma nrubiga-ókè nke iwe-Ya gādi n'aru onye nēweta ihere.

Ilu 15

1 Ọziza-okwu di nrò nēme ka ọnuma laghachi azu: Ma okwu nwuta nākpali iwe. 2 Ire ndi mara ihe nēme ka ihe-ọmuma di nma: Ma ọnu ndi-nzuzu nēkwuwa okwu uche b͕agọrọ ab͕agọ. 3 N'ebe nile ọ bula ka anya abua nke Jehova di, Nēche ndi ọjọ na ndi bu ezi madu nche. 4 Ire nke nāgwọ madu bu osisi nēnye ndu: Ma omume b͕agọrọ ab͕agọ nime ya bu ntipia nime mọ madu. 5 Onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ nēlelì idọ-aka-na-nti nna-ya: Ma onye nāriba iba-nba ama gaghọ onye nwere ezi uche. 6 N'ulo onye ezi omume ka ọtutu àkù di: Ma n'ihe-omume nke onye nēmebi iwu ka nmekpa-aru di. 7 Eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi mara ihe nēfesa ihe-ọmuma: Ma obi ndi-nzuzu adighi-eme otú a. 8 Àjà ndi nēmebi iwu bu ihe-árú n'anya Jehova: Ma ekpere ndi ziri ezi bu ihe nātọ Ya utọ. 9 Ihe-árú n'anya Jehova ka uzọ onye nēmebi iwu bu: Ma onye nāb͕aso ezi omume ka Ọ nāhu n'anya. 10 Idọ-aka-na-nti ọjọ diri onye nārapu uzọ: Onye nākpọ iba-nba asì gānwu. 11 Ala-mọ na ebe-ila-n'iyì di n'iru Jehova? Òbi umu madu gēsi aṅa ghara idi n'iru Ya? 12 Ọ dighi-atọ onye nākwa emò utọ ka abara ya nba: Ọ bughi onye mara ihe ka ọ gējekuru. 13 Obi nke nāṅuri ọṅu nēme ka iru di nma: Ma eji ihe-nwuta nke obi tib͕ue mọ madu. 14 Obi onye-nghọta nāchọ ihe-ọmuma: Ma ọnu ndi-nzuzu nāzù onwe-ya n'uche b͕agọrọ ab͕agọ dika anu-ulo. 15 Ubọchi nile nke onye ewedara n'ala jọrọ njọ: Ma onye obi-ya di nma nēri oké oriri mb͕e nile. 16 Ọ di nma inwe ihe ntà n'egwu Jehova, Kari inwe ọtutu àkù ma ọb͕ub͕a-aghara adi ya. 17 Ọ di nma, bú òkè ihe-oriri nke bu nání akwukwọ nri, ma ihu-n'anya di n'ebe ahu, Kari ehi azùru azù ib͕u eb͕u, ma ikpọ-asì adi ya. 18 Onye-ọnuma nākpali ise-okwu: Ma onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ nēme ka ilu-ọ̀gù di jū. 19 Uzọ onye-ume-ngwu di ka ogige ogwu: Ma okporo-uzo ndi ziri ezi bu uzọ atuliri atuli. 20 Nwa nke mara ihe nēme ka nna-ya ṅuria: Ma madu nzuzu nēleda nne-ya anya. 21 Uche b͕agọrọ ab͕agọ buru onye obi amam-ihe kọrọ ọṅù: Ma onye-nghọta nēme ka ije-ije-ya zie ezi. 22 Nmebi èchìchè nile di mb͕e ìzù nzuzo nādigh: Ma n'ọtutu ndi nādu ọdu ka ha nēguzosi ike. 23 Ọṅù diri onye ọ bula n'ọziza-okwu nke ọnu-ya: Ọzọ, okwu ekwuru na mb͕e-ya, le ka o si di nma nke-uku! 24 Uzọ ndu nārigo elu n'ebe onye nwere uche nọ, Ka o we si n'ala-mọ di n'okpuru wezuga onwe-ya. 25 Ulo ndi-npako ka Jehova gēropu: Ma Ọ gēme ka ókè-ala nwanyi di-ya nwuru guzosie ike. 26 Ihe-árú n'anya Jehova ka èchìchè ọjọ nile bu: Ma okwu-ọnu utọ nile di ọcha. 27 Onye nēmekpa èzí-na-ulo nke aka ya aru ka onye akpiri urù nēzighi ezi nākpọ nku bu: Ma onye nākpọ onyinye iri-ngo asì gādi ndu. 28 Obi onye ezi omume nātughari uche n'iza okwu: Ma ọnu ndi nēmebi iwu nēkwuwa ihe ọjọ di iche iche. 29 Jehova di anya n'ebe ndi nēmebi iwu nọ: Ma ekpere ndi ezi omume ka Ọ nānu. 30 Ihe nke nēnye anya ìhè nēme ka obi ṅuria: Ezi ihe anuru anu nēme ka ọkpukpu nile ma abuba. 31 Nti nke nānu iba-nba nke ndu, N'etiti ndi mara ihe ka ọ gānọ ọnọdu-abali. 32 Onye nēzere idọ-aka-na-nti nāju nkpuru-obi nke aka ya: Ma onye nānu iba-nba nēnweta obi amam-ihe. 33 Egwù Jehova bu idọ-aka-na-nti nke amam-ihe; Ọ bu kwa n'iru nsọpuru ka obi ume-ala nāga.

Ilu 16

1 Madu nwe ido obi n'usoro: Ma n'aka Jehova ka ọziza ire sitere. 2 Uzọ nile nke onye ọ bula di ọcha n'anya-ya: Ma Onye nātùzi mọ nile nke madu ka Jehova bu. 3 Turu ọlu-gi nile rue Jehova aru, Èchìchè-gi nile ewe guzosie ike. 4 Ihe nile ka Jehova kpuru n'ihi Onwe-ya: E, ọbuná onye nēmebi iwu nāluru ubọchi ihe ọjọ ọlu. 5 Ihe-árú n'anya Jehova ka onye ọ bula bu nke obi-ya di elu: Site n'aka rue aka, agaghi-agu ya n'onye nēmeghi ihe ọjọ. 6 Eji ebere na ezi-okwu ekpuchi ajọ omume: Ọ bu kwa egwu Jehova ka madu ji esi n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya. 7 Mb͕e uzọ nile nke onye ọ bula nātọ Jehova utọ, Ọ nēme ọbuná ndi-iro-ya ka ha na ya di n'udo. 8 Ọ di nma inwe ihe ntà n'ezi omume, Kari inwe ọtutu ihe-omume ma ikpé ziri ezi adighi ya. 9 Obi madu nēchè uzọ-ya: Ma Jehova nēme ka nzọ-ukwu-ya guzosie ike. 10 Ọjuju-ase di n'eb͕ub͕ere-ọnu abua nke eze: Mb͕e ọ nēkpe ikpe ọnu-ya adighi-emekpu emekpu. 11 Ihe-ọtùtù na ihe-osìsì ziri ezi diri Jehova: Ọlu-Ya ka nkume-osìsì nile nke akpa bu. 12 Ọ buru ndi-eze ihe-árú ime nmebi-iwu: N'ihi na ezi omume ka oche-eze ji eguzosi ike. 13 Ihe nātọ ndi-eze utọ ka eb͕ub͕ere-ọnu ezi omume bu; Ọ bu kwa onye nēkwu ihe ziri ezi ka ha nāhu n'anya. 14 Ọnuma eze bu ndi-ozi ọnwu: Ma onye mara ihe gēkpuchi ya. 15 N'ìhè iru eze ka ndu di; Mb͕e ihe madu nātọ ya utọ, ọ di ka igwe-oji nke miri-ozuzo ikpe-azu. 16 Inweta amam-ihe, le ka o si di nma nke-uku kari ọla-edo ọma! Inweta nghọta kwa, le ka o si buru ihe anārọputa nke-uku kari ọla-ọcha! 17 Uzọ atuliri atuli nke ndi ziri ezi bu isi n'ihe ọjọ wezuga onwe-ha: Onye nēdebe nkpuru-obi-ya nēche uzọ-ya. 18 N'iru ntipia ka npako nāga, Ọ bu kwa n'iru isu-ngọngọ ka idi-elu nke mọ madu nāga. 19 Ọ di nma inwe mọ di ala n'etiti ndi ewedara n'ala, Kari isoro ndi-npako kesa ihe akwatara n'agha. 20 Onye nwere uche n'okwu Chineke gāchọta ezi ihe: Ọzọ, onye nātukwasi Jehova obi, onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu. 21 Onye obi-ya mara ihe, agākpọ ya onye-nghọta: Ọzọ, utọ eb͕ub͕ere-ọnu nātukwasiri nmuta ihe. 22 Isi-iyi nke ndu ka ezi uche bu n'ebe ndi-nwe-ya nọ: Ma idọ-aka-na-nti nke ndi uche-ha b͕agọrọ ab͕agọ bu uche b͕agọrọ ab͕agọ. 23 Obi onye mara ihe nēme ka ọnu-ya nwe uche, Ọ nātukwasi-kwa-ra eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua nmuta. 24 Ub͕ub͕ọ-manu-aṅu ka okwu-ọnu utọ nile bu, Nke nātọ nkpuru-obi utọ, buru kwa ihe nāgwọ ọkpukpu n'ọria. 25 Uzọ di nke ziri ezi n'iru madu, Ma nsọtu-ya bu uzọ nile nke ọnwu. 26 Ọchichọ-nkpuru-obi nke onye nādọb͕u onwe-ya n'ọlu adọb͕uworo ya onwe-ya n'ọlu; N'ihi na ọnu-ya erugidewo ya. 27 Onye jọb͕uru onwe-ya nēgwuputa ihe ọjọ: Ọ bu kwa n'eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka ihe dika ọku nāru aru di. 28 Onye nāb͕akuta Chineke azu nēzisa ise-okwu: Ọzọ, onye nēkwu okwu-azu nēkewa ezi eyì. 29 Onye nēme ihe-ike nārà madu-ibe-ya urà, Nēme kwa ka o je ije n'uzọ nādighi nma. 30 Onye nātachi anya-ya abua ichè èchìchè ib͕akuta Chineke azu, Onye nātabi eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua, o mezuwo ihe ọjọ. 31 Okpu-eze nke mara nma ka isi-awọ bu, N'uzọ ezi omume ka agāhu ya. 32 Ọ di nma, bú onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ, kari dike: Ọ di kwa nma, bú onye nāchi mọ-ya, kari onye nēwere obodo n'agha. 33 Anēfe nzà, Ma n'aka Jehova ka ikpé-ya nile sitere.

Ilu 17

1 Ọ di nma iri iberibe achicha kpọrọ nku, ma inọ-n'udo adi ya, Kari ulo juputara n'àjà anēri nālu ọ̀gù. 2 Orù nke nwere uche gāchi nwa madu nēweta ihere, Ọ bu kwa n'etiti umu-nne nwa ahu ka ọ gēkere ihe-nketa. 3 Ite eji anucha ihe diri ọla-ọcha, oké ọku di-kwa-ra ọla-edo: Ma Onye nānwa obi bu Jehova. 4 Onye nēme ihe ọjọ nātọ nti n'ala n'eb͕ub͕ere-ọnu nēkwu ajọ ihe; Onye-okwu-ugha nāṅa nti ire nēkwu ihe-ila-n'iyì. 5 Onye nākwa ob͕eye emò atawo Onye meworo ya uta: Onye nāṅuri ọṅu bayere nhuju-anya ndi ọzọ, agaghi-agu ya n'onye nēmeghi ihe ọjọ. 6 Okpu-eze ndi-okenye ka umu umu bu; Ọzọ, ima-nma nke umu bu nna-ha. 7 Ọ maghi nma n'ebe onye-nzuzu nọ, bú eb͕ub͕ere-ọnu nēkwu ihe makarisiri nma: Èb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwu okwu-ugha gēsi kwa aṅa ma nma n'ebe onye amara aha-ya nọ? 8 Nkume amara ka iri-ngo bu n'anya ndi-nwe-ya: Ebe ọ bula ọ nēche iru ọ nāgara ya. 9 Onye nēkpuchi njehie nāchọ ihu-n'anya: Ma onye nēkwu okwu mb͕e na mb͕e nēkewa ezi eyì. 10 Ibasi-nba-ike nābàmi nime onye-nghọtaKari ka ọgu otiti ise gābà nime onye-nzuzu. 11 Nání nnupu-isi ka onye ọjọ nāchọ; Ọ bu kwa onye-ozi nēnweghi obi-ebere ka agēziga megide ya. 12 Ka nne-bear nke b͕ara aka umu-ya zute madu, Kari onye-nzuzu n'uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ. 13 Onye nēnyeghachi ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe, Ihe ọjọ agaghi-apu n'ulo-ya. 14 Dika mb͕e madu nērùpu miri, otú a ka isi-nmalite ise-okwu di: N'ihi ya tutu ilu-ọ̀gù esie ike rapu ya. 15 Onye nāgu onye nēmebi iwu n'onye ezi omume, na onye nāma onye ezi omume ikpe, Ihe-árú n'anya Jehova ka ha abua bu n'otù. 16 N'ìhi gini kwa ka ego-ọzùzù-ahia di n'aka onye-nzuzu izuta amam-ihe, Mb͕e obi amam-ihe nādighi? 17 Na mb͕e nile ka eyì nāhu n'anya, Anāmu kwa-nwa-nne bayere ahuhu. 18 Madu nke obi amam-ihe kọrọ nānara madu n'aka ibu onye-mbe, Ọ nāghọ onye nọ na mbe n'iru madu-ibe-ya. 19 Onye nāhu njehie n'anya nāhu ilu-ọ̀gù n'anya: Onye nēme ka ọnu-uzọ-ya di elu nāchọ ntipia. 20 Onye obi-ya b͕agọrọ ab͕agọ adighi-achọta ezi ihe: Ọzọ, onye nāb͕anwe onwe-ya n'ire-ya gādabà n'ihe ọjọ. 21 Onye nāmu onye-nzuzu ọ gāburu ya iru-újú: Nna onye-nzuzu adighi-aṅuri kwa ọṅu. 22 Obi nke nāṅuri ọṅu nēme ka aru di nma: Ma mọ madu nke etib͕uru etib͕u nāmikọ ọkpukpu. 23 Ihe-iri-ngo ka onye nēmebi iwu nēweputa n'uwe-obi-ya, Iwezuga uzọ nile nke ikpé. 24 N'iru onye-nghọta ka amam-ihe di: Ma anya abua nke onye-nzuzu di na nsọtu uwa. 25 Ihe nākpasu nna-ya iwe ka nwa nzuzu bu, Ọ bu-kwa-ra nwanyi muru ya ihe-ilu. 26 Ọzọ, iri onye ezi omume nra adighi nma, Ọ dighi kwa nma itib͕u ndi amara aha-ha n'ihi izi-ezi-ha. 27 Onye nēb͕ochi okwu-ọnu-ya mara ihe-ọmuma: Ọzọ, onye mọ-ya juru ajuru bu onye-nghọta. 28 Ọbuná onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ, mb͕e ọ nāb͕a, anāgu ya n'onye mara ihe: Onye nēkpuchi eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua bu onye-nghọta.

Ilu 18

1 Ọchichọ nke ya onwe-ya nāchọsi ike ka onye nēkewapu onwe-ya nāchọ, Ọ bu ezi nzube-ihe nile ka ọ nālusosi ọ̀gù ike. 2 Nghọta adighi-atọ onye-nzuzu utọ, Kama ọ bu nání ka obi-ya we kpughe onwe-ya. 3 Mb͕e onye nēmebi iwu nābata, nleda-anya abatawo kwa, Ọ bu kwa nlelì ka ita-uta soro. 4 Miri nke miri emi ka okwu nile nke ọnu madu bu; Iyi nērù erù ka isi-iyi amam-ihe bu. 5 Ihu onye nēmebi iwu iru-ọma adighi nma, Iwezuga onye ezi omume n'ikpé. Eb͕ub͕ere-ọnu abua nke onye-nzuzu nābà n'ilu-ọ̀gù, 6 Ọnu-ya nākpọ kwa iti-ihe òkù. 7 Ọnu onye-nzuzu buru ya nbibi, Eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua bu kwa ọnyà nkpuru-obi-ya. 8 Okwu nile nke onye nēkwu okwu-azu di ka iberibe-nri nātọ utọ nke-uku, Okwu ahu aridawo kwa n'ime-ime-ala afọ. 9 Ọzọ, onye di ume-ngwu n'ije-ozi-ya, Onye ahu bu nwa-nne nke onye-nwe nbibi. 10 Ulo-elu di ike ka aha Jehova bu: Nime ya ka onye ezi omume nāb͕abà, o we nọ n'elu. 11 Àkù ọgaranya bu obodo-ya siri ike, Ọ di kwa ka mb͕idi di elu nime ntughari-obi-ya nile. 12 N'iru ntipia ka obi madu di elu, Ọ bu kwa n'iru nsọpuru ka obi ume-ala nāga. 13 Onye nāzaghachi okwu tutu ọ nu, Uche b͕agaọrọ ab͕agọ na ọnọdu-ihere ka ọ buru ya. 14 Mọ madu gānagide ọria-ya; Ma mọ madu nke etib͕uru etib͕u, ònye gēburu ya? 15 Obi onye-nghọta nēnweta ihe-ọmuma; Ọzọ, nti ndi mara ihe nāchọ ihe-ọmuma. 16 Onyinye madu nākwara ya uzọ sara mbara, Ọ bu kwa n'iru ndi uku ka o nēdu ya je. 17 Onye ezi omume n'anya ndi-ikpe ka onye ahu bu nke buru uzọ kpe ọnu-ya; Ma madu-ibe-ya abia gwuputa ala okwu-ya. 18 Ife-nzà nēme ka ise-okwu kwusi, Ọ bu kwa ndi nwere ume ka ọ nēkewa. 19 Nwa-nne ejehieworo megide di ike iwere kari obodo siri ike: Ise-okwu di kwa ka ihe-ntuchi nile nke-elu. 20 Site na nkpuru nke ọnu onwe-ya ka afọ gēju afọ onye ọ bula; N'ihe-omume nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya ka afọ gēju ya. 21 Ọnwu na ndu di ire n'aka; Ọzọ, ndi nāhu ya n'anya gēri nkpuru-ya. 22 Onye chọtaworo nwunye achọtawo ezi ihe, Ọ gēnweputa kwa n'aka Jehova na ihe-ya gātọ Ya utọ. 23 Okwu aririọ-amara di iche iche ka ob͕eye nēkwu: Ma ọgaranya nāza ike ike. 24 Onye nēnwe ọtutu eyì nēnwe ha ibibi onwe-ya: Ma onye nāhu n'anya di nārapara n'aru kari nwa-nne.

Ilu 19

1 Ọ di nma, bú ob͕eye nke nēje ije n'izu-okè-ya, Kari onye eb͕ub͕ere-ọnu-ya b͕agọrọ ab͕agọ n'okwu, onye bu kwa onye-nzuzu. 2 Ọzọ, mb͕e nkpuru-obi nēnweghi ihe-ọmuma ọ dighi nma; Onye ukwu-ya nēme ngwa nēhie uzọ. 3 Uche b͕agọrọ ab͕agọ nke madu nēkpù uzọ-ya iru; Ọ bu kwa imegide Jehova ka obi-ya di ọku. 4 Àkù nātukwasiri madu ọtutu eyì: Ma onye nēnweghi ihe, anēkewapu ya n'ebe eyì-ya nọ. 5 Agaghi-agu onye-àmà okwu-ugha n'onye nēmeghi ihe ọjọ; Ọzọ, onye nēkupu okwu-ugha dika ume agaghi-ewepuga onwe-ya. 6 Ọtutu madu nāchọ ime ka iru onye amara aha-ya dajua: Onye ọ bula bu-kwa-ra onye nēnye onyinye eyì. 7 Umu-nne nile nke ob͕eye nākpọ ya asì: Ǹdi-eyì-ya gēsi aṅa ghara inọ ya n'ebe di anya kari! Ọ nāb͕aso okwu-ọnu di iche iche nke nābughi ihe. 8 Onye nēnweta obi amam-ihe nāhu nkpuru-obi-ya n'anya: Onye nēdebe nghọta gāchọta ezi ihe. 9 Agaghi-agu onye-àmà okwu-ugha n'onye nēmeghi ihe ọjọ; Ọzọ, onye nēkupu okwu-ugha dika ume gāla n'iyì. 10 Idi-pekepeke amaghi onye-nzuzu nma; Ò gēsi kwa aṅa ma orù nma ichi ndi-isi? 11 Ezi uche madu nēme ka ọ ghara iwe iwe ọsọsọ; Ọ bu kwa ima-nma-ya igabiga njehie. 12 Ọb͕ub͕ọ-uja dika nke ọdum ka iwe di ọku nke eze bu; Ma dika igirigi n'elu ihe-ọkukú ka utọ ihe madu nātọ ya di. 13 Ila-n'iyi nile n'ebe nna-ya nọ ka nwa nzuzu bu: Ọzọ, miri-ọtutu nātu mb͕e nile ka ise-okwu nwunye bu. 14 Ulo na àkù bu ihe-nketa ndi bu nna nārapu: Ma Jehova ka nwunye nke nwere uche sitere n'aka. 15 Ume-ngwu nēme ka oké ura dakwasi madu; Ọ bu kwa nkpuru-obi nke di ume-ngwu ka agu nāgu. 16 Onye nēdebe ihe enyere n'iwu nēdebe nkpuru-obi-ya: Onye nēleda uzọ-ya nile anya gānwu. 17 Onye nēbinye Jehova ihe ka onye nēmere onye nēnweghi ike amara bu, Ọ bu kwa nmeso ọma ya ka Ọ gākwughachi ya. 18 Dọ nwa-gi aka na nti, n'ihi na olile-anya di; Atukwasi-kwa-la obi-gi n'ime ka ọ nwua. 19 Onye oké ọnuma ganāra nra: N'ihi na ọ buru na i naputa ya, i gēme kwa ya ọzọ. 20 Nuru ndum-ọdu, nara kwa idọ-aka-na-nti, Ka i we mara ihe n'ikpe-azu-gi. 21 Ọtutu èchìchè di n'obi madu; Ma ndum-ọdu Jehova, nke ahu gēguzosi ike. 22 Ihe nēme ka anāchọsi madu ike bu ebere-ya: Ọzọ, ob͕eye di nma kari onye-okwu-ugha. 23 Egwu Jehova nēdubà na ndu: Onye nwe-kwa-ra ya, ọ gānọ n'afọ-ojuju; Ihe ọjọ agaghi-eleta ya. 24 Onye-ume-ngwu esumiwo aka-ya n'ọkwa, Ọ gaghi-eweghachi ya ọbuná n'ọnu-ya. 25 Tie onye nākwa emò ihe, onye nēnweghi uche gāghọ onye nwere ezi uche: Ọzọ, bara onye-nghọta nba, ọ gāghọta ihe-ọmuma. 26 Onye nāpunara nna-ya ihe, nke nēme kwa ka nne-ya b͕alaga, Bu nwa nēweta ihere nēme kwa ka enwe iru-ihere. 27 Nwam, rapu inu idọ-aka-na-ntiNke nēme ka i si n'okwu-ọnu nile nke ihe-ọmuma waghari. 28 Onye-àmà nke jọb͕uru onwe-ya nākwa ikpé emò: Ọzọ, ọnu ndi nēmebi iwu nēloda ajọ ihe. 29 Edoziworo ndi nākwa emò ikpé di iche iche, Ọ bu kwa iti-ihe di iche iche ka edoziworo nye azu ndi-nzuzu.

Ilu 20

1 Onye nākwa emò ka manya-vine bu, onye-nkpọtu ka ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya bu; Onye ọ bula nke nāwaghari site na ya amaghi ihe. 2 Ọb͕ub͕ọ-uja dika nke ọdum ka oké ujọ anātu eze bu: Onye nākpasu Ya iwe nke nērubiga ókè nēmehie megide ndu nke aka ya. 3 Ọ buru madu nsọpuru ikwusi ilu ọ̀gù: Ma onye ọ bula nke uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ ganālusi ọ̀gù ike. 4 N'ihi na ọ bu mb͕e oyi nātu, onye-ume-ngwu agaghi-alu ọlu ubi; Ọ gāriọ aririọ na mb͕e owuwe-ihe-ubi, ọ dighi kwa ihe ọ gēnwe. 5 Miri nke miri emi ka ndum-ọdu n'obi madu bu; Ma onye-nghọta gādọputa ya. 6 Ọtutu madu nākpọsa, onye ọ bula ebere nke aka ya: Ma onye kwesiri ntukwasi-obi, ònye gāchọputa ya? 7 Onye ezi omume nke nējeghari n'izu-okè-ya, Ndi ihe nāgara nke-ọma ka umu-ya nke gānọchi ya gābu. 8 Eze nke nānọkwasi n'oche ikpéJi anya-ya abua afuchapu ihe ọjọ nile. 9 Ònye gāsi, Emewom ka obim di ọcha, Aghọwom onye di ọcha pua na nmehiem? 10 Uzọ nkume-isì-ihe abua, na uzọ ephah abua, Ihe-árú n'anya Jehova ka ha abua bu n'otù. 11 Ọbuná nwata nēme ka amata ya site n'omume-ya nile, Ma ọlu-ya di ọcha, ma o zi-kwa-ra ezi. 12 Nti nke nānu ihe, na anya nke nāhu uzọ, Jehova emewo ọbuná ha abua. 13 Ahula urá n'anya, ka ewe ghara inapu gi ihe nile; Meghe anya-gi abua, rijue nri afọ. 14 Ọ jọrọ njọ, ọ jọrọ njọ, ka onye nāzù azù nāsi: Ma mb͕e ọ laworo n'ulo-ya, mb͕e ahu ka ọ nānya isi. 15 Ọla-edo di, na ọtutu ruby: Ma ihe di oké ọnu-ahia ka eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwu ihe-ọmuma bu. 16 Chiri uwe-ya, bú onye nọworo onye ala ọzọ na mbe; N'ọnọdu ndi mba ọzọ nara ya onwe-ya n'ihe-ibe. 17 Ọ nātọ madu utọ, bú nri okwu-ugha; Ma emesia nkpuru-ájá gēju ya ọnu. 18 Èchìchè nile nēji ndum-ọdu guzosi ike: Gi were kwa ezi ndum-ọdu bue agha. 19 O nēkpughe ìzù nzuzo, bú onye nējeghari dika onye nāb͕a àmà ọjọ. Agwakọta-kwa-la onwe-gi n'onye ji eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua arafu madu. 20 Onye nākọcha nna-ya ma-ọbu nne-ya, Oriọna-ya gānyu na nb͕achi nke ọchichiri. 21 Ihe-nketa nke anānara ọsọsọ na mbu; Agaghi-agọzi kwa ikpe-azu-ya. 22 Asila, M'gākwughachi ugwọ ihe ọjọ: Le anya Jehova, Ọ gāzọputa kwa gi. 23 Ihe-árú n'anya Jehova ka uzọ nkume-isì-ihe abua bu; Ihe-osìsì aghughọ adighi kwa nma. 24 N'aka Jehova ka nzọ-ukwu nile nke madu nēsite; Màdu gēsi kwa aṅa ghọta uzọ-ya? 25 Ọnyà mara madu ma ọ buru na o were ọsọsọ si, Ọ di nsọ, Ma mb͕e ọ kwesiri nkwa o we ju ajuju. 26 Ọ nāfuchapu ndi nēmebi iwu, bú eze mara ihe, Ọ nēme kwa ka wheel nsucha-ọka laghachi n'elu ha. 27 Oriọna Jehova ka ume ndu madu bu, Nēgwuputa ime-ime-ala afọ nile. 28 Ebere na ezi-okwu nēchebe eze: O ji kwa ebere akwagide oche-eze-ya. 29 Ima-nma umu-okorọbia ka ike-ha bu: Ihe-nsọpuru ndi-okenye ka isi-awọ bu kwa. 30 Ufiri-utali nke nēmeru aru nēchichapu ihe ọjọ: Iti-ihe nēru kwa ime-ime-ala afọ.

Ilu 21

1 Iyi di iche iche nke juputara na miri ka obi eze bu n'aka Jehova: N'ebe ọ bula nke nātọ Ya utọ ka Ọ nēwezuga ya. 2 Uzọ ọ bula nke onye ọ bula ziri ezi n'anya-ya abua: Ma onye nātùzi obi nile ka Jehova bu. 3 Ime ezi omume na ihe ekpere n'ikpeBu ihe Jehova nārọputa kari àjà. 4 Anya npako na obi di nganga, Ọbuná oriọna nke ndi nēmebi iwu, bu nmehie. 5 Èchìchè nile nke onye di nkọ nēdubà nání n'urù: Ma èchìchè nile nke onye ọ bula nke nēme ngwa nēdubà nání n'ikọ-ukọ. 6 Ikpa àkù site n'ire okwu-ughaBu otù nku-ume anēfesa n'ifufe; ndi nāchọ àkù ahu nāchọ ọnwu. 7 Ipunara-madu-ihe nke ndi nēmebi iwu gēkpochapu ha; N'ihi na ha juru ime ihe ekpere n'ikpe. 8 Ihe b͕agọrọ ab͕agọ nke-uku ka uzọ onye ikpe mab͕uru ya bu: Ma onye di ọcha n'obi, ọlu-ya ziri ezi. 9 Ọ di nma inọkwasi na nkuku elu ulo, Kari inọyere nwayi nēse okwu n'ulo bùru ibù. 10 Nkpuru-obi nke onye nēmebi iwu nāchọsi ihe ọjọ ike: Madu-ibe-ya abughi onye imere amara n'anya-ya. 11 Mb͕e anēri onye nākwa emò nra, anēme ka onye nēnweghi uche mara ihe: Ọzọ, mb͕e anēme ka onye nke mara ihe nwe uche, ọ nānara ihe-ọmuma. 12 Onye ezi omume nēnwe uche n'imeso ulo nke onye nēmebi iwu; Ọ nēkpù ndi nēmebi iwu iru n'ihi ihe ọjọ ha. 13 Onye nēkwuchipu nti-ya n'iti-nkpu nke onye nēnweghi ike, Ya onwe-ya gākpọ kwa nkpu, ma agaghi-aza ya. 14 Onyinye enyere na nzuzo nādaju iwe, Iri-ngo ezobere n'uwe-obi nādaju kwa ọnuma siri ike. 15 Ọ buru onye ezi omume ọṅù ime ihe ekpere n'ikpe; Ma nbibi diri ndi nālu ajọ ihe. 16 Madu nke nēsi n'uzọ ezi uche akpafu, Nime nkpọkọta nke ndi nādighi ndu ka o gēzu ike. 17 Onye ihe kọrọ ka onye nāhu ọṅù n'anya gābu: Onye nāhu manya-vine na manu n'anya agaghi-abu ọgaranya. 18 Ihe-nb͕aputa ib͕aputa onye ezì omume ka onye nēmebi iwu bu; Ọzọ, n'ọnọdu ndi ziri ezi ka onye nāghọb͕u aghọb͕u nọ. 19 Ọ di nma inọ n'ala bú nání ọzara, Kari inọyere nwayi nēse okwu nākpasu kwa iwe. 20 Àkù anāchọsi ike na manu di n'ebe-obibi nke onye mara ihe; Ma madu nzuzu nēloda ya. 21 Onye nāb͕aso ezi omume na ebereNāchọta ndu, na ezi omume, na nsọpuru. 22 Obodo ndi-dike ka onye nke mara ihe rigobàworo, O we me ka ike nke ikwesi-ntukwasi-obi-ya rida. 23 Onye nēdebe ọnu-ya na ire-yaNēdebe nkpuru-obi-ya ka ọ pua n'ahuhu nile. 24 Onye-nganga na onye-npako, onye nākwa emò bu aha-ya, Ọ nālu ọlu n'iwe nērubiga ókè nke nganga. 25 Ọchichọ siri ike nke onye-ume-ngwu nēme ka ọ nwua; N'ihi na aka-ya abua juru ilu ọlu. 26 Ogologo ubọchi nile ka ọ chọsiworo ihe ike nke-uku: Ma onye ezi omume nēnye, ọ dighi-eb͕ochi kwa aka-ya inye ihe. 27 Àjà nke ndi nēmebi iwu bu ihe-árú: O gēsi kwa aṅa ghara ibu ihe-árú kari, mb͕e o ji nzube ọjọ weta ya? 28 Onye-àmà okwu-ugha gāla n'iyì: Ma onye nānu, rue mb͕e ebighi-ebì ka o gēkwu. 29 Onye nēmebi iwu emewo ka iru-ya sie ike: Ma onye ziri ezi, onye ahu nēdozi uzọ-ya nile. 30 Ọ dighi amam-ihe di, ọ dighi kwa nghọta di, Ọ dighi kwa ndum-ọdu di, na ncherita-iru Jehova. 31 Inyinya bu ihe anēdoziri ubọchi agha: Ma Jehova nwe nzọputa.

Ilu 22

1 Ihe anārọputa ka ezi aha bu kari ọtutu àkù, Amara di kwa nma kari ọla-ọcha na ọla-edo. 2 Ọgaranya na ob͕eye ezutewo: Onye meworo ha nile bu Jehova. 3 Onye nwere ezi uche ahuwo ihe ọjọ, we zobe onwe-ya: Ma ndi nēnweghi uche agabigawo, ewe rie ha nra. 4 Ọkpukpu-ọlu nke obi ume-ala na egwu JehovaBu àkù, na nsọpuru, na ndu. 5 Ogwu na ib͕udu di n'uzọ onye b͕agọrọ ab͕agọ n'obi: Onye nēdebe nkpuru-obi-ya gānọ ha n'ebe di anya. 6 Zulite nwata dika uzọ-ya si di, Ọbuná mb͕e o mere okenye ọ gaghi-esi nime ya wezuga onwe-ya. 7 Ọgaranya nāchi ndi-ob͕eye, Ọzọ, orù ka onye nēbiri ego buru onye-nbinye. 8 Onye nāgha ajọ omume dika nkpuru gēwe ajọ ihe dika ihe-ubi: Nkpa-n'aka nke nrubiga ókè nke iwe-ya gāgwusi kwa. 9 Onye nwere anya ọma, onye ahu ka agāgọzi; N'ihi na o werewo nri-ya ufọdu nye onye nēnweghi ike. 10 Chupu onye nākwa emò, ise-okwu gāpu kwa; E, iru-uka na nlelì gākwusi. 11 Onye nāhu idi-ọcha nke obi n'anya, Eyì-ya ka eze gābu n'ihi amara nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua. 12 Anya abua nke Jehova echebewo onye-ihe-ọmuma, Ma Ọ nēkpù okwu nile nke onye-nghọb͕u iru. 13 Onye-ume-ngwu asiwo, Ọdum di n'èzí: N'etiti amá ka agēb͕um. 14 Ọbù nke miri emi ka ọnu ndinyom nābughi nwunye-gi bu: Onye Jehova nēwesa oké iwe gādabà nime ya. 15 Uche b͕agọrọ ab͕agọ bu ihe ekekọtaworo n'obi nwata; Ma nkpa-n'aka nke idọ-aka-na-nti gēme ka ọ di anya n'ebe ọ nọ. 16 Onye nēmeb͕u onye nēnweghi ike ime ka àkù nke aka ya ba uba, Ya na onye nēnye ọgaranya ihe gābiaru nání ihe-ukọ. 17 Tọ nti-gi n'ala, nu okwu nile nke ndi mara ihe, Tukwasi kwa obi-gi n'ihe-ọmumam. 18 N'ihi na ọ di utọ mb͕e i debe ha n'afọ-gi, Mb͕e ha gēguzosi ike n'otù n'elu eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua. 19 Ọ bu ka ntukwasi-obi-gi we di na JehovaKa m'meworo ka i mara ha ta, ọbuná gi onwe-gi. 20 Èdetaghm i isi iheNime ndum-ọdu di iche iche na ihe-ọmuma; 21 Ime ka i mara ikwesi-ntukwasi-obi nke okwu-ọnu nile nke ezi-okwu, Ka i we weghachiri ndi nēzite gi okwu-ọnu nile nke bu ezi-okwu? 22 Anapula onye nēnweghi ike ihe n'ike, n'ihi na onye nēnweghi ike ka ọ bu, Azọpia-kwa-la onye ewedara n'ala n'ọnu-uzọ-ama: 23 N'ihi na Jehova gēkpe ọnu-ha, We punara ndi ahu ndu, bú ndi nāpunara ha ihe. 24 Gi na onye-iwe abula eyì; I gaghi-eso kwa onye-ọnuma ba n'ulo: 25 Ka i we ghara imuta uzọ-ya nile, We wetara nkpuru-obi-gi ọnyà. 26 Abula otù nime ndi gānara madu n'aka, Abu-kwa-la otù nime ndi nọ na mbe bayere ugwọ di iche iche. 27 Ọ buru na i nweghi ihe ikwu ugwọ, N'ìhi gini ka ọ gānapu ihe-ndina-gi n'okpuru gi? 28 Ewezugala ókè-ala nke diworo mb͕e ebighi-ebi, Nke nna-gi-hà kpaworo. 29 Ì huwo madu nke nēme ngwa n'ije-ozi-ya? n'iru ndi-eze ka o gēguzo onwe-ya; Ọ gaghi-eguzo onwe-ya n'iru ndi anāmaghi aha-ha.

Ilu 23

1 Mb͕e i soro onye nāchi achi iri nri, Ghọta nke-ọma onye ahu nke nọ n'iru gi; 2 Tukwasi kwa mma n'akpiri-gi, Ma ọ buru na onye nri-ya nātọ ya utọ ka i bu. 3 Achọsila nri utọ ya ike; Ebe nri ahu bu nri okwu-ugha. 4 Adọb͕ula onwe-gi n'ọlu ibu ọgaranya; Site na nghọta-gi ra ya aka. 5 Ì gātukwasi anya-gi abua na ya? ọ dighi kwa: N'ihi na àkù nēmere onwe-ya nkù n'ezie, Dika ugo ka ọ nēfesi n'elu-igwe. 6 Erila nri nke onye nwere anya ọjọ, Achọsi-kwa-la nri utọ ya ike: 7 N'ihi na dika o si echè èchìchè na nkpuru-obi-ya, otú a ka ọ di: Rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, ka ọ nāsi gi; Ma obi-ya adighi n'ebe i nọ. 8 Iberibe-nri-gi nke i riworo ka i gāb͕ọputa, Okwu-gi nile nke di utọ ewe funari gi. 9 Ekwula okwu na nti onye-nzuzu; N'ihi na ọ gēleda ezi uche nke okwu-gi nile anya. 10 Ewezugala ókè-ala nke diworo mb͕e ebighi-ebi; Abà-kwa-la n'ọhia ọ bula nke umu-nb͕ei: 11 N'ihi na Onye-nb͕aputa-ha di ike; Ya onwe-ya gēkpe ọnu-ha megide gi. 12 Me ka obi-gi ba n'idọ-aka-na-nti, Me kwa ka nti-gi abua ba n'okwu-ọnu nile nke ihe-ọmuma. 13 Eb͕ochila idọ-aka-na-nti n'aru nwata: Mb͕e i gēji nkpa-n'aka tie ya, ọ gaghi-anwu. 14 Gi onwe-gi gēji nkpa-n'aka tie ya, We naputa nkpuru-obi-ya n'ala-mọ. 15 Nwam, ọ buru na obi-gi mara ihe, Obim gāṅuri, ọbuná nkem: 16 Akurum abua gāwuli kwa n'ọṅù, Mb͕e eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua nēkwu ihe ziri ezi. 17 Ekwela ka obi-gi kwoso ndi-nmehie ekworo: Kama n'egwu Jehova ka i gānọ ogologo ubọchi nile. 18 N'ihi na ọdi-n'iru aghaghi idi; Agaghi-ebipu kwa olile-anya-gi. 19 Nuru, gi onwe-gi, nwam, we mara ihe, Me kwa ka obi-gi gazi agazi n'uzọ. 20 Anọla n'etiti ndi nāṅubiga manya-vine ókè; N'etiti ndi nēribiga anu ókè: 21 N'ihi na onye nāṅubiga manya ókè na onye nēribiga ihe ókè ka agānapu ihe nile: Ọ bu kwa nkirika ákwà ka òrù-ura gēyikwasi madu. 22 Ge nna-gi, bú onye muru gi, nti, Eleda-kwa-la nne-gi anya mb͕e o mere agadi. 23 Zuta ezi-okwu, ere-kwa-la ya; E, amam-ihe, na idọ-aka-na-nti, na nghọta. 24 Nna nke onye ezi omume gēteghari egwú ọṅù nke-uku: Onye nāmu kwa onye mara ihe gāṅuri ọṅu na ya. 25 Ka nna-gi na nne-gi ṅuria, Ka nwanyi muworo gi teghari kwa egwú ọṅù. 26 Nwam, nyem obi-gi, Ka uzọm nile tọ kwa anya-gi abua utọ. 27 N'ihi na ọbù nke miri emi ka nwanyi nke nākwa iko bu; Olùlù nke di nkpà ka nwanyi nābughi nwunye-gi bu. 28 E, nwanyi ahu nēche anwu dika onye nāpunara madu ihe, Ọzọ, ndi-nghọb͕u n'etiti madu ka ọ nēme ka ha ba uba kari. 29 Ònye nwere ahuhu? ònye nwere iru-újú? ònye nwere ise-okwu? Ònye nwere ntamu? ònye nwere ob͕ub͕u-mma n'efu? Ònye nwere anya nācha ọbara-ọbara? 30 Ọ bu ndi nānọ na manya-vine ogologo mb͕e; Ndi nābà n'ulo ichọputa manya agwara agwa. 31 Elekwasila manya-vine anya mb͕e ọ nācha ọbara-ọbara, Mb͕e ọ nēnye udi-ya n'iko, Mb͕e ọ nāsughari n'iko nke-ọma: 32 N'ikpe-azu-ya ọ bu dika agwọ ka ọ nāta, Ọ bu kwa dika aju-ala ka ọ nātu. 33 Anya-gi abua gāhu ndinyom nābughi nwunye-gi, Obi-gi gēkwu kwa okwu ib͕akuta Chineke azu. 34 I gādi kwa ka onye nēdina n'etiti oké osimiri, Ma-ọbu dika onye nēdina n'elu akpu-ub͕ọ. 35 Ha etib͕uwom, ka i gāsi, ariaghm ọria; Ha apiawom ihe, amaghm: Òle mb͕e m'gēteta? m'gāchọ kwa ya ọzọ.

Ilu 24

1 Ekwosola ndi ọjọ ekworo, Achọsi-kwa-la ike inọ n'etiti ha: 2 N'ihi na ipunara-madu-ihe ka obi-ha nātughari, Okwu nmeb͕u ka eb͕ub͕ere-ọnu-ha nēkwu. 3 Amam-ihe ka eji ewu ulo; Ọ bu kwa nghọta ka eji eme ka o guzosie ike: 4 Site kwa n'ihe-ọmuma ka ime-ulo-ya nile nējuputaN'àkù nile di oké ọnu-ahia di kwa utọ. 5 Onye mara ihe di ike; E, onye nwere ihe-ọmuma nēme ka ike nwe ume. 6 N'ihi na ezi ndum-ọdu ka i gēji eburu onwe-gi agha: Ọzọ, nzọputa di n'ọtutu ndi nādu ọdu. 7 Amam-ihe adikara onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ elu: Ọ dighi-asaghe ọnu-ya n'ọnu-uzọ-ama. 8 Onye nēchè ime ihe ọjọ, Ya ka agākpọ onye-nwe nzube ọjọ nile. 9 Nzube nke onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ bu nmehie: Ọzọ, ihe-árú n'anya madu ka onye nke nākwa emò bu. 10 Ọ buru na i di ume-ngwu n'ubọchi ahuhu, Ike-gi pere npe. 11 Naputa ndi anāchigara ọnwu, Ndi ahu kwa anēwezuga n'ọnọdu-ha nye n'ob͕ub͕u, gi lezie anya ka i b͕ochie ha. 12 Mb͕e i si, Le, ayi amaghi ihe a: Onye nātùzi obi nile, Ònye ahu adighi-aghọta? Onye nēche kwa nkpuru-obi-gi nche, Ònye ahu adighi-ama? Ọ̀ gaghi-enyeghachi kwa madu dika ọlu-ya si di? 13 Nwam, racha manu-aṅu, n'ihi na ọ di nma; Ya na manu-aṅu nke si n'ub͕ub͕ọ-manu-aṅu nābusi, nke nātọ okpo-ọnu-gi utọ: 14 Mara na otù a ka amam-ihe diri nkpuru-obi-gi: Ọ buru na i chọtawo ya, ọdi-n'iru gādi kwa, Agaghi-ebipu kwa olile-anya-gi. 15 Gi onye nēmebi iwu, echela anwu imegide ebe-obibi onye ezi omume; Apunarala ya ebe-izu-ike-ya: 16 N'ihi na ub͕ò asa ka onye ezi omume nāda, bili kwa ọzọ: Ma ndi nēmebi iwu nāsu ngọngọ n'ihe ọjọ. 17 Aṅurila mb͕e onye-iro-gi nāda, Ka obi-gi ghara kwa iteghari egwú ọṅù mb͕e ọ nāsu ngọngọ: 18 Ka Jehova we ghara ihu ya, o we jọ njọ n'anya-Ya, O we me ka iwe-Ya si n'aru ya laghachi. 19 Emela ka iwe-gi di ọku n'ihi ndi nēme ihe ọjọ; Ekwosola ndi nēmebi iwu ekworo. 20 N'ihi na ọdi-n'iru agaghi-adiri onye ọjọ; Oriọna ndi nēmebi iwu gānyu. 21 Nwam, tua egwu Jehova na eze: Agwakọtala onwe-gi na ndi nēnwo enwo: 22 N'ihi na ọ bu na mberede ka nhuju-anya-ha gēbili; Ọdida nke ha abua kwa, ònye mara ya? 23 Ndia bu kwa okwu nke ndi mara ihe. Imata iru madu n'ikpé adighi nma. 24 Onye nāsi onye nēmebi iwu, Onye ezi omume ka i bu; Ndi nile di iche iche gākpọlu ya, mba nile gēwesa ya iwe: 25 Ma ndi nābara ya nba ka ọ gādi utọ, Ọ bu kwa ndi ahu ka ezi ngọzi gābiakwasi. 26 O ji eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua esutu ọnu, Bú onye nāza okwu ziri ezi. 27 Dozie ije-ozi-gi n'èzí, Jikere-kwa-ra ya onwe-gi n'ọhia; Emesia wu kwa ulo-gi. 28 Abula onye-àmà megide madu-ibe-gi n'efu; Ì gēji kwa eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua rafu? 29 Asila, Dika o siri mem, otú a ka m'gēme ya; M'gēnyeghachi onye ahu dika ọlu-ya si di. 30 N'akuku ubi onye-ume-ngwu ka m'gabigara, Na n'akuku ubi-vine nke madu obi amam-ihe kọrọ; 31 Ma, le, o púchiri n'ogwu, Akuba kpuchiri iru-ya, Akwada-kwa-ra mb͕idi nkume ya. 32 Mu onwem we hu, m'we tukwasi obim na ya: Ahurum ya, we nata idọ-aka-na-nti. 33 Nwa ura ntà, nwa irù-ura ntà, Nwa ikpakọba-aka ntà idina ala: 34 Ob͕eye-gi ewe bia dika onye nējeghari ipunara madu ihe; Ihe-ukọ-gi kwa, dika nwoke ji ọta.

Ilu 25

1 Ndia bu kwa ilu Solomon turu, nke ndi Hezekaia, bú eze Juda, deputara n'akwukwọ. 2 Ọ bu nsọpuru Chineke izobe okwu: Ma nsọpuru ndi-eze bu igwuputa ala okwu. 3 Elu-igwe n'idi-elu-ya, na ala n'omimi-ya, Na obi ndi-eze, ọ dighi ngwuputa di ha. 4 Wepu afuru-uzu n'ọla-ọcha, Ihe ewe putara onye nānucha ọla: 5 Wepu onye nēmebi iwu n'iru eze, Oche-eze-ya ewe guzosie ike n'ezi omume. 6 Asọpurula onwe-gi n'iru eze, Eguzo-kwa-la n'ọnọdu ndi uku: 7 N'ihi na ọ di nma ka asi gi, Rigota ebe a; Kari ka eme ka i di ala n'iru onye amara aha-ya, Onye anya-gi abua huworo. 8 Apula ngwa ngwa ise okwu, Ka o we ghara ibu na i maghi ihe i gēme n'ikpe-azu-ya, Mb͕e madu-ibe-gi etiyewo gi n'ọnọdu-ihere. 9 Gi na madu-ibe-gi kwurita okwu-ikpe-gi, Ekpughe-kwa-la izù nzuzo nke onye ọzọ: 10 Ka onye nke nānu ya we ghara ikwulu gi, Akukọ ihe ọjọ gi ewe ghara isi n'ebe i nọ laghachi. 11 Nkpuru-osisi apple ọla-edo nime nkata ọla-ọchaKa okwu ekwuru na mb͕e kwesiri ya bu. 12 Nb͕a-aka ọla-edo na ihe-ichọ-nma nke ọla-edo ọmaKa onye nāba nba nke mara ihe bu na nti nke nānu ihe. 13 Dika oyi snow n'ubọchi owuwe-ihe-ubi, Otú a ka ukọ̀ nke kwesiri ntukwasi-obi diri ndi nēziga ya; Ọ bu kwa nkpuru-obi ndi-nwe-ya ka ọ nēwelata. 14 Igwe-oji na ifufe nke miri-ozuzo nādighiKa onye nke nānya isi n'onyinye okwu-ugha bu. 15 Site n'eweghi iwe ọsọsọ ka anāràye onye-isi, Ire nrò nānyaji kwa ọkpukpu. 16 Ọ̀ bu manu-aṅu ka i chọtaworo? racha nke gēzuru gi; Ka i we ghara iriju ya afọ, we b͕ọ ya. 17 Me ka ukwu-gi kọ ukọ n'ulo madu-ibe-gi; Ka ihe-gi we ghara iju ya afọ, o we kpọ gi asì. 18 Otùtù-agha na mma-agha na àkú di nkọKa onye nke nāb͕a àmà okwu-ugha megide madu-ibe-ya bu. 19 Ezé nyajiri anyaji na ukwu chikwa-puru echikwapuKa itukwasi onye-nghọb͕u obi n'ubọchi ahuhu bu. 20 Dika onye nēyipu uwe n'ubọchi oyi, dika manya b͕ara uka n'elu akanwu, Otú a ka onye nābùru obi jọrọ njọ abù di. 21 Ọ buru na agu nāgu onye nākpọ gi asì, gi me ka o rie nri; Ọ buru kwa na akpiri nākpọ ya nku, gi me ka ọ ṅua miri: 22 N'ihi na icheku nēre ọku ka i nāgukwasi n'isi-ya, Jehova gākwughachi kwa gi. 23 Ifufe Ugwu nāmuputa oké miri-ozuzo: Ọ bu kwa iru oké iwe ka iré nēkwu okwu-azu nāmuputa. 24 Ọ di nma inọkwasi na nkuku elu ulo, Kari inọyere nwayi nēse okwu n'ulo bùru ibù. 25 Dika miri oyi si adiri nkpuru-obi nāda #mbà, Otú a ka okwu ọma anuru site n'ala di anya di. 26 Isi-iyi azọtọrọ azọtọ na ebe-nsuputa-miri bibiri ebibiKa onye ezi omume nke anēwezuga n'ọnọdu-ya n'iru onye nēmebi iwu bu. 27 Iracha manu-aṅu ri nne adighi nma: Otú a ọ buru na madu egwuputa ala nsọpuru-ha ọ bughi nsọpuru. 28 Obodo etikpọrọ etikpọ nke mb͕idi nādighiKa onye ọ bula nke nādighi-ebọchi mọ-ya bu.

Ilu 26

1 Dika snow na mb͕e okpom-ọku, na dika miri-ozuzo na mb͕e owuwe-ihe-ubi, Otú a nsọpuru amaghi nma nye onye-nzuzu. 2 Dika nnunu na nfeghari-ya, dika eleke n'ofufe-ya, Otú a nkọcha adighi-abia n'efu. 3 Utari diri inyinya, bridle diri inyinya-ibu, Nkpa-n'aka di-kwa-ra azu ndi-nzuzu. 4 Azala onye-nzuzu dika uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ si di, Ka i we ghara idi ka ya, ọbuná gi onwe-gi. 5 Za onye-nzuzu dika uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ si di, Ka o we ghara ibu onye mara ihe n'anya-ya. 6 Onye nēbipu ukwu onwe-ya na onye nāṅu ime-ihe-ike dika miriKa onye ahu bu nēzi ozi site n'aka onye-nzuzu. 7 Ogwe-ukwu abua nke onye-ngwurọ nākwu efe: Otú a ka ilu di n'ọnu ndi-nzuzu. 8 Dika akpa nkume di iche iche nke di oké ọnu-ahia n'obo nkume, Otú a ka onye nēnye onye-nzuzu nsọpuru di. 9 Dika ogwu nke dumiworo n'aka onye nāṅubiga manya ókè, Otú a ka ilu n'ọnu ndi-nzuzu di. 10 Onye-ọ̀kà nākpu ihe nile, Ma onye nēgo onye-nzuzu ilu ọlu di ka onye nēgo ndi nāgabiga agabiga. 11 Dika nkita nke chighariworo ọzọ n'ihe ọ b͕ọrọ, Otú a ka onye-nzuzu di nke nēme kwa ihe uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ ọzọ. 12 Ì huwo onye ọ bula nke bu onye mara ihe n'anya-ya? Olile-anya diri onye-nzuzu kari onye ahu. 13 Onye-ume-ngwu asiwo, Ọdum di n'uzọ; Ọdum di n'amá. 14 Dika ibo-ọnu-uzọ si emeghari n'ihe-nkoye-ya, Otú a ka onye-ume-ngwu nēmeghari n'ihe-ndina-ya. 15 Onye-ume-ngwu esumiwo aka-ya n'ọkwa; Ọ nāgwu ya ike iweghachi ya n'ọnu-ya. 16 Onye-ume-ngwu bu onye mara ihe n'anya-yaKari madu asa ndi nāzaghachi okwu n'ezi uche. 17 Onye nējide nkita na nti ka ọ bu, Bú onye nāgabiga, nēwebiga iwe ókè n'ihi ise-okwu nābughi nke ya. 18 Dika onye-ará nke nātu àkú nēre ọku, Na àkú, na ọnwu; 19 Otú a ka onye ahu di nke ghọb͕uworo madu-ibe-ya, We si, Ọ̀ bughi egwú ka m'nēgwu? 20 Mb͕e nkú nādighi ọku gānyu: Otú a mb͕e ọ dighi onye nēkwu okwu-azu, ise-okwu gādaju. 21 Dika icheku si di n'ebe icheku nēre ọku di, na dika nkú si di n'ebe ọku di; Otú a ka onye nēse okwu di ime ka ilu-ọ̀gù nwuru ọku. 22 Okwu nile nke onye nēkwu okwu-azu di ka iberibe-nri di iche iche nātọ utọ nke-uku, Okwu ahu aridawo kwa n'ime-ime-ala afọ. 23 Ejùjù nke amachitaworo n'afuru-uzu ọla-ọchaKa eb͕ub͕ere-ọnu nke nēre ọku na obi ọjọ bu. 24 Eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka onye nke nākpọ asì nēji buru onye-iru-abua, Ma nime onwe-ya ka ọ nētiye aghughọ: 25 Mb͕e olu-ya nēkwu amara, ekwela ya; N'ihi na ihe-árú asa di n'obi-ya. 26 Ọ bu ezie na ikpọ-asi-ya ji nrafu ekpuchi onwe-ya, Ma agēkpughe ihe ọjọ ya nime nkpọkọta ndi-ya. 27 Onye nēgwu olùlù, nime ya ka ọ gādabà: Ọzọ, onye nākpọre nkume, ya ka ọ gālaghachikuru. 28 Ire okwu-ugha nākpọ ndi o gwepiaworo asì; Ọzọ, ọnu nke nēkwu ire-utọ nākpata nnuda.

Ilu 27

1 Anyala isi bayere echi; N'ihi na i maghi ihe chi gābọ. 2 Ka onye ala ọzọ to gi, ma ọ bughi ọnu-gi; Ka onye mba ọzọ to gi, ma ekwela ka eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua to gi. 3 Nkume di arọ́, ájá bu kwa ibú; Ma nkpasu-iwe nke onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ di arọ́ kari ha abua. 4 Ihe nēnweghi obi-ebere ka ọnuma bu, iju-miri ka iwe bu kwa; Ma ònye gēguzo n'iru ekworo? 5 Ọ di nma, bú iba-nba n'ìhè, Kari ihu-n'anya nke ezobeworo ezobe. 6 Ihe kwesiri ntukwasi-obi ka ob͕ub͕u-mma nile nke onye nāhu gi n'anya bu: Ma ihe riri nne ka nsutu-ọnu nke onye nākpọ gi asì bu. 7 Nkupuru-obi nke rijuworo afọ nāzọda manu-aṅu nke si n'ub͕ub͕ọ-manu-aṅu nābusi: Ma ihe nile ọ bula nke nēlu ilu nātọ nkpuru-obi agu nāgu utọ. 8 Dika nnunu nke nēsi n'akwu-ya efefu, Otú a ka madu di nke nēsi n'ọnọdu-ya akpafu. 9 Manu na ihe-nsure-ọku nke nēsi ísì utọ nēme ka obi ṅuria: Otú a ka utọ eyì madu di nke sitere na ndum-ọdu nke nkpuru-obi. 10 Arapula eyì-gi na eyì nna-gi; Abà-kwa-la n'ulo nwa-nne-gi n'ubọchi nhuju-anya-gi: Ọ di nma, bú ab͕ata-obi nke nọ nso, Kari nwa-nne nke nọ n'ebe di anya. 11 Mara ihe, nwam, we me ka obim ṅuria, Ka m'we zaghachi onye nātam uta okwu. 12 Onye nwere ezi uche ahuwo ihe ọjọ, we zobe onwe-ya: Ma ndi nēnweghi uche agabigawo, ewe rie ha nra. 13 Chiri uwe-ya, bú onye nọworo onye ala ọzọ na mbe; N'ọnọdu nwanyi nābughi nwunye-ya nara ya onwe-ya n'ihe-ibe. 14 Onye ji oké olu agọzi madu-ibe-ya, nke nēbili n'isi-ututu ime ya, Nkọcha ka agāgu ngọzi ahu nye ya. 15 Miri-ọtutu nke nātu mb͕e nile n'ubọchi oké miri-ozuzo, Ya na nwanyi nke nēse okwu yiri: 16 Onye nēzobe ya ezobewo ifufe, Ọ bu kwa manu ka aka-nri-ya nēzute. 17 Ígwè nāmucha ígwè; Otú a ka madu nāmucha iru eyì-ya. 18 Onye nēche osisi fig gēri nkpuru-ya; Ọ bu kwa onye nāriba onye-nwe-ya ama ka agāsọpuru. 19 Dika miri si eme ka iru hu iru, Otú a ka obi nēme ka madu hu madu. 20 Afọ adighi-eju ala-mọ na ebe-ila-n'iyì; Otú a afọ adighi-eju anya abua nke madu. 21 Ite eji anucha ihe diri ọla-ọcha, oké ọku di-kwa-ra ọla-edo, Anānwa kwa onye ọ bula site n'otuto-ya. 22 Ọ buru na i ji aka-íkwè supia onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ n'íkwè n'etiti ọka asuru asu, Uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ agaghi-esi n'aru ya wezuga onwe-ya. 23 Mara iru igwè ewu na aturu-gi nke-ọma, Tukwasi obi-gi n'igwè anu-ulo-gi nile: 24 N'ihi na ọ bughi rue mb͕e ebighi-ebi ka àkù di; Okpu-eze kwa, ọ̀ nādiru ọb͕ọ nile? 25 Ekpopuwo ahihia, ewe hu ahihia ndu, Chikọta kwa ihe-ọkukú nile nke ugwu nile. 26 Umu-aturu diri uwe-oyiyi-gi, Ọnu-ahia nke ọhia-gi ka ewu bu kwa: 27 Ara ewu gēzu-kwa-ra nri-gi, zu-kwa-ra nri ulo-gi; Buru kwa ihe gēdebe umu-ab͕ọghọ-gi ndu.

Ilu 28

1 Ndi nēmebi iwu ab͕alagawo mb͕e ọ dighi onye nāchu ha: Ma ndi ezi omume nwere ntukwasi-obi dika ọdum. 2 N'ihi njehie nke ala ha di ọtutu, bú ndi-isi-ya: Ma site na madu nwere nghọta na ihe-ọmuma ka ọnọdu-ya gādigide ogologo mb͕e. 3 Nwoke bu ob͕eye nke nēmeb͕u ndi nēnweghi ike, Ọ di ka miri-ozuzo nke nāzachapu ihe, nri we ghara idi. 4 Ndi nārapu iwu nēto onye nēmebi iwu, Ma ndi nēdebe iwu nāluso ha ọ̀gù. 5 Ndi ọjọ adighi-aghọta ikpé: Ma ndi nāchọ Jehova nāghọta ihe nile. 6 Ọ di nma, bú ob͕eye nke nēje ije n'izu-okè-ya, Kari onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uzọ-ya abua, ọ bu ezie na onye ahu bu ọgaranya. 7 Onye nēdebe iwu bu nwa nāghọta ihe: Ma onye bu eyì ndi nēribiga ihe ókè nētiye nna-ya n'onọdu-ihere. 8 Onye nēme ka àkù-ya ba uba site n'inara uma na ọmuru-nwa, Ọ nēkpokọta ya nye onye nēmere ndi nēnweghi ike amara. 9 Onye nēwezuga nti-ya n'inu iwu, Ọbuná ekpere-ya bu ihe-árú. 10 Onye nēme ka ndi ziri ezi waghari n'uzọ ọjọ, N'olùlù nke aka ya ka ya onwe-ya gādabà: Ma ndi zuru okè gēketa ezi ihe. 11 Onye mara ihe n'anya-ya ka ọgaranya bu; Ma onye nēnweghi ike nke nāghọta ihe nēgwuputa ala-ya. 12 Mb͕e obi ndi ezi omume nātọ ha utọ, ọtutu ima-nma di: Ma mb͕e ndi nēmebi iwu nēbili, agāchọ madu achọ. 13 Onye nēkpuchi njehie-ya nile, ọ gaghi-agara ya: Ma onye nēkwuputa ha, nke nārapu kwa ha, agēnwe obi-ebere n'aru ya. 14 Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu nke nātu oké egwu mb͕e nile: Ma onye nēme ka obi-ya sie ike gādabà n'ihe ọjọ. 15 Ọdum nke nāb͕o uja na anu-ọhia bear nke nāb͕aghariKa onye nēmebi iwu nke nāchi ndi nēnweghi ike bu. 16 Gi onye-ndú nke nghọta kọrọ, nke bu kwa onye-nmeb͕u uku, Onye nākpọ urù nēzighi ezi asì gēme ka ubọchi-ya nile di ogologo. 17 Madu nke ọbara madu nānyib͕u, Rue olùlù ka ọ gāb͕alaga; ka onye ọ bula ghara ijide ya. 18 Onye nēje ije n'izu-okè ka agāzọputa: Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uzọ abua gāda ngwa ngwa. 19 Onye nālu ala-ubi-ya, afọ gēju ya na nri: Ma onye nāb͕aso ihe-efu di iche iche, afọ gēju ya n'ibu-ob͕eye. 20 Onye ọ bula nke kwesiri ntukwasi-obi gēnwe ọtutu ngọzi: Ma onye nānukpọ onwe-ya ibu ọgaranya, agaghi-agu ya n'onye nēmeghi ihe ọjọ. 21 Imata iru madu n'ikpé adighi nma: Ọ dighi kwa nma ka madu ji n'ihi iberibe nri nējehie. 22 Onye nāb͕aso àkù ka onye nwere anya ọjọ bu, Ma ọ maghi na ihe-ukọ gābiakute ya. 23 Onye nābara madu nba gēmesia huta amaraKari onye nēkwu ire-utọ. 24 Onye nānapu nna-ya ma-ọbu nne-ya ihe n'ike, si, Ọ dighi njehie ọ bu; Onye ejikọtaworo ya na onye-nbibi ka ọ bu. 25 Onye nkpuru-obi-ya di nganga nākpali ise-okwu: Ma onye nātukwasi Jehova obi, agēme, ya ka ọ ma abuba. 26 Onye nātukwasi obi n'obi nke aka ya, onye ahu bu onye-nzuzu: Ma onye nēje ije n'amam-ihe, onye ahu ka agēme ka o wepuga onwe-ya. 27 Onye nēnye ob͕eye ihe, ihe adighi-akọ ya: Ma onye nēzobe anya-ya abua, agābu ya ọtutu ọnu. 28 Mb͕e ndi nēmebi iwu nēbili, madu ezobe onwe-ya: Ma mb͕e ha nāla n'iyì, ndi ezi omume aba uba.

Ilu 29

1 Onye anābara nba ọtutu mb͕e ma ọ nēkwesi olu-ya ike, N'otù ntabi-anya ka agētipia ya, ọ dighi kwa ngwọta di. 2 Mb͕e ndi ezi omume nāba uba kari, ndi ala-ha nāṅuri: Ma mb͕e onye nēmebi iwu nāchi achi, ndi ala-ya nēze ume. 3 Onye ọ bula nke nāhu amam-ihe n'anya nēme ka nna-ya ṅuria: Ma onye bu eyì nke ndinyom nākwa iko nāla àkù-ya n'iyì. 4 Eze nēji ikpé ziri ezi eme ka ala-ya guzo: Ma onye nānara onyinye nākwada ya. 5 Nwoke nke nāgwa madu-ibe-ya okwu ire-utọNāb͕asara nzọ-ukwu-ya nile ub͕u. 6 Na njehie onye ọjọ ka ọnyà di: Ma onye ezi omume nēti nkpu ọṅù nāṅuri kwa. 7 Onye ezi omume nāmata okwu-ikpe nke ndi nēnweghi ike: Onye nēmebi iwu adighi-aghọta ihe-ọmuma. 8 Ndi nākwa emò nāfuye ọku n'obodo: Ma ndi mara ihe nēme ka iwe laghachi azu. 9 Ọ buru na onye mara ihe esoro onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ kpe ikpe, Ma o nwere ọnuma ma ọ chìri ọchì, izu-ike adighi kwa. 10 Ndi-ọbara nākpọ onye zuru okè asì: Ma ndi ziri ezi nāchọ ọdi-nma nkpuru-obi-ya. 11 Mọ nile nke onwe-ya ka onye-nzuzu nēme ka ọ puta ìhè: Ma onye mara ihe nēb͕ochi mọ-ya, nēme kwa ka ọ dajua. 12 Ọ buru na onye nāchi achi aṅa nti okwu-ugha, Ndi nile nējere ya ozi bu ndi nēmebi iwu. 13 Ob͕eye na onye-nmeb͕u ezutewo: Onye nēnye anya ha abua ìhè bu Jehova. 14 Eze nke nēkpe ndi nēnweghi ike ikpe n'ikwesi-ntukwasi-obi, Oche-eze-ya gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi. 15 Nkpa-n'aka na iba-nba nēnye amam-ihe: Ma nwata nke anārapu n'onwe-ya nēme ka ihere me nne-ya. 16 Mb͕e ndi nēmebi iwu nāba uba kari, njehie nāba kwa uba kari: Ma ndi ezi omume gēlekwasi ọdida-ha. 17 Dọ nwa-gi aka na nti, ọ gēme kwa ka i zu ike; E, ọ gēnye nkpuru-obi-gi ihe-utọ. 18 Mb͕e ọhù nādighi, ndi ala ahu adighi nchikọta: Ma onye nēdebe iwu, ihe nāgara onye ahu nke-ọma. 19 Ọ bughi okwu agēji dọ orù aka na nti: N'ihi na ọ bu ezie na ọ nāghọta, ma ọ̀ dighi ihe ọ nāza. 20 Ì huwo onye ọ bula nānukpọ onwe-ya n'okwu-ya nile? Olile-anya diri onye-nzuzu kari onye ahu. 21 Onye zutọworo orù-ya site na nwata, N'ikpe-azu-ya orù ahu gāghọ kwa nwa. 22 Onye-iwe nākpali ise-okwu, Ọzọ, onye nēnwe ọnuma ri nne nējehie ri nne. 23 Npako madu gēme ka ọ di ala: Ma onye mọ-ya di ala nējidesi nsọpuru ike. 24 Onye ya na onye-ori nēkekọ ihe nākpọ nkpuru-obi ya onwe-ya asì: Ọb͕ub͕a-iyi ka ọ nānu, ma ọ dighi-egosi ihe ọ bula. 25 Egwu madu nēweta ọnyà: Ma onye nātukwasi Jehova obi, agēme ka ọ nọ n'elu. 26 Ọtutu madu nāchọ iru onye nāchi achi: Ma n'aka Jehova ka ikpé onye ọ bula nēsi bia. 27 Ihe-árú n'anya ndi ezi omume ka onye ajọ omume bu: Ọzọ, ihe-árú n'anya onye nēmebi iwu ka onye ziri ezi n'uzọ-ya bu.

Ilu 30

1 Okwu Agua nwa Jake; ibu eboro ya. Ihe nke si n'ọnu nwoke ahu putara Itiel, ọbuná Itiel na Ukal. 2 N'ezie anu-ọhia ka m'bu kari onye ọ bula, Ọ dighi kwa nghọta madu m'nwere 3 Amutaghkwam amam-ihe, Ọ dighi kwa ihe-ọmuma Onye Nsọ m'mara. 4 Ònye rigoworo n'elu-igwe, we rida? Ònye chikọtaworo ifufe nime nkwukwuba-aka-Ya abua? Ònye kegideworo miri n'uwe-Ya? Ònye meworo ka nsọtu nile nke uwa guzosie ike? Gini bu aha-Ya, gini bu kwa aha nwa-Ya, ma asi na i mara? 5 Okwu-ọnu ọ bula nke Chineke bu ihe anuchaworo: Ọta ka Ọ buru ndi nāb͕abà nime Ya. 6 Atukwasila ihe n'okwu-Ya nile, Ka O we ghara ibara gi nba, i we ghọ onye-okwu-ugha. 7 Ihe abua ka m'riọworo Gi; Ajulam ha tutu mu anwua: 8 Me ka ihe-efu na okwu-ugha di anya n'ebe m'nọ: Enyelam ọnọdu-ob͕eye ma-ọbu àkù; Me ka m'rie nri rurum: 9 Ka afọ we ghara ijum, m'we gọ agọ, si, Ònye bu Jehova? Ma-ọbu ka ewe ghara inapum ihe nile, m'we zu ori, We were aha Chinekem me ihe ọjọ. 10 Ekpèla orù ikpè n'iru onye-nwe-ya, Ka o we ghara ikọcha gi, ikpé ewe ma gi. 11 Ọb͕ọ di nke nākọcha nna-ha, Ha adighi-agọzi kwa nne-ha. 12 Ọb͕ọ di nke di ọcha n'anya-ha, Ma orurú-inyi-ha nke nēsì ísì ka anāsachapughi. 13 Ọb͕ọ di, le ka anya-ha si di elu nke-uku! Anēbuli kwa mbubere-anya-ha. 14 Ọb͕ọ di, mma-agha ka ezé nile ha bu, ọ bu kwa mma ka ikiri-ezé-ha bu, Irichapu ndi ewedara n'ala n'uwa, na irichapu ndi-ob͕eye n'etiti madu. 15 Etu nwere umu abua, nāsi, Nye, nye. Ihe atọ di nke afọ nādighi-eju, E, anọ di nke nāsighi, O b͕owo: 16 Ala-mọ; na afọ nwayi-àgà; Na ala afọ miri nējughi; Na ọku nke nāsighi, O b͕owo. 17 Anya nke nākwa nna-ya emò, Nke nēleda kwa iṅa nne-ya nti, Ugolo-ọma nke ndagwurugwu gāghuputa ya, Umu-ugo gēri kwa ya. 18 Ihe atọ di nke karirim ighọta, E, anọ nke m'nāmagh: 19 Uzọ ugo n'elu-igwe; Uzọ agwọ n'elu oké nkume; Uzọ ub͕ọ n'etiti oké osimiri; Na uzọ nwoke n'ebe nwa-ab͕ọghọ nọ. 20 Otú a ka uzọ nwayi nākwa iko di; O riwo ihe, hicha kwa ọnu-ya, Si, Emeghm ajọ ihe ọ bula. 21 N'okpuru ihe atọ ka uwa maworo jijiji, N'okpuru ihe anọ kwa, nke ọ nāpughi iburu: 22 N'okpuru orù mb͕e ọ nāghọ eze; Na onye-nzuzu mb͕e nri nēju ya afọ; 23 N'okpuru nwayi anākpọ asì mb͕e ọ nwere di; Na nwanyi nēje ozi mb͕e ọ nēketa ihe nwanyi-nwe-ya. 24 Ihe anọ di nke di ntà n'elu-uwa, Ma ihe ahu mara ihe nke-uku: 25 Danda bu ndi nādighi ike, Ma ha nēdozi nri-ha na mb͕e okpom-ọku; 26 Coney bu ndi nēnweghi ume, Ma ha nēdo ulo-ha na nkume di elu; 27 Ọ dighi eze igurube nwere, Ma mb͕e ha nāpu ha nēkè onwe-ha n'usu, ha nile; 28 Nche-ulo nēji aka-ya nile agigado, Ma ihe ahu di n'ulo uku eze. 29 Ihe atọ di nke nāzọ ukwu nke-ọma, E, anọ di nke nēje ije nke-ọma: 30 Ọdum, nke bu dike n'etiti anu nile, Ọ dighi-esi kwa n'iru ihe ọ bula laghachi azu; 31 Inyinya-agha; na nkpi; Na eze, nke nbili megide ya nādighi. 32 Ọ buru na i zuzuwo nzuzu n'ibuli onwe-gi, Ma-ọbu ọ buru na i zubewo nzube ọjọ, Tukwasi aka-gi n'ọnu-gi. 33 N'ihi na opìpì miri-ara-ehi nēweputa miri-ara raru araru, Ọzọ, opìpì imi nēweputa ọbara: Otú a ọpìpì iwe nēweputa ise-okwu.

Ilu 31

1 Okwu Lemuel, bú eze; ibu eboro ya nke nne-ya ji dọ ya aka na nti. 2 Gini, nwam? gini kwa, nwa nke afọm? Gini kwa, nwa nke nkwa nile m'kwere? 3 Enyela ndinyom ike-gi, Enye-kwa-la ihe nēbibi ndi-eze uzọ-gi nile. 4 Ka ndi-eze ghara iṅu manya-vine, Lemuel, ka ndi-eze ghara iṅu manya-vine; Ka ndi-isi ghara kwa isi, Òle ebe ka ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya di? 5 Ka ha we ghara iṅu, we chezọ ukpuru atọrọ, We b͕anwe ikpé nke ndi nile ewedara n'ala. 6 Nyenu onye nāla n'iyì ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, Nye-kwa-nu ndi nkpuru-obi-ha di ilu manya-vine: 7 Ya ṅua, we chezọ ob͕eye ọ bu, Ghara kwa icheta ọnọdu ọjọ ya ọzọ. 8 Saghere onye-ob͕i ọnu-gi, N'okwu-ikpe nke ndi nile nāla n'iyì. 9 Saghe ọnu-gi, kpe ikpe n'ezi omume, Kpeputa kwa onye ewedara n'ala na ob͕eye. 10 Nwayi nke nējide onwe-ya nke-ọma, ònye gāchọputa ya? N'ihi na ọnu-ahia-ya kariri ruby nke-uku. 11 Obi di-ya atukwasiwo ya obi, Ọ dighi kwa ihe-nkwata nākọ nwoke ahu. 12 Nwayi ahu emesowo ya ezi ihe, ọ bughi kwa ihe ọjọ, Ubọchi nile nke ndu-ya. 13 Ọ chọwo aji-anu na flax, We nālu ọlu nātọ aka-ya abua utọ. 14 Ọ di ka ub͕ọ onye-ahia; Site n'ebe di anya ka ọ nēweta nri-ya. 15 O nēbili kwa mb͕e abali nādi kwa, We nye ulo-ya nri, Nye kwa umu-ab͕ọghọ-ya òkè-ha. 16 O zuwo izùzù ọhia, we nweta ya: Site n'ihe aka-ya abua lutara ka ọ kuworo ubi-vine. 17 O kewo ike n'úkwù-ya dika ihe-ọkiké, Me kwa ka ogwe-aka-ya abua nwe ume. 18 Ọ matawo na ihe-ahia-ya di nma: Oriọna-ya adighi-anyu n'abali. 19 Aka-ya abua ka o setiworo n'osisi ikuku ogho, Ọbu-aka-ya abua ejidesiwo kwa ozele ike. 20 Ọbu-aka-ya ka ọ b͕asapuworo nye onye ewedara n'ala; E, aka-ya abua ka o setiworo rue ob͕eye aru. 21 Ọ dighi-atu egwu snow, na ọ gēme ulo-ya ihe; N'ihi na ulo-ya nile nēyi uwe uhie. 22 Ákwà-nb͕abá mara nma ka ọ kpaworo onwe-ya; Ezi ákwà ọcha na ákwà ododo ka uwe-ya bu. 23 Onye amara n'ọnu-uzọ-ama ka di-ya bu, Mb͕e ọ nānọdu n'etiti ndi-okenye ala. 24 Uwe ákwà ọcha ka nwayi ahu kpaworo, we re ya; Ihe-ọkiké ka ọ nyeworo onye-ahia. 25 Ike na ima-nma bu uwe-oyiyi-ya; Ọ nāchì kwa ubọchi di n'iru ọchì. 26 Ọnu-ya ka ọ sagheworo n'amam-ihe; Iwu nke ebere dikwasi kwa n'ire-ya. 27 Ọ nēche ojije nile nke èzí-na-ulo-ya nche nke-ọma, Ọ bughi kwa nri ume-ngwu ka o nēri. 28 Umu-ya ebiliwo, kpọ ya nwayi ihe nāgara nke-ọma; Di-ya kwa, o nēto kwa ya, si: 29 Ọtutu umu-ndinyom emewo omume kwesiri ndinyom nējide onwe-ha nke-ọma, Ma gi onwe-gi kachasi ha nile. 30 Amara bu ugha, ima-nma bu kwa ihe-efu: Ma nwayi nke nātu egwu Jehova, nwayi ahu gēnwe otuto 31 Nyenu ya ihe sitere na nke aka-ya abua lutara; Ka ọlu-ya nile to kwa ya n'ọnu-uzọ-ama nile.

Eklisiastis 1

1 Okwu nke Onye-nkpọkọta, bú nwa Devid, bú eze nime Jerusalem. 2 Ihe-efu kachasi ihe-efu nile, ka Onye-nkpọkọta siri; ihe-efu kachasi ihe-efu nile, ihe nile bu ihe-efu. 3 Òle ihe fọduru madu nime ndọb͕u-ya nile nke ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu n'okpuru anyanwu? 4 Otù ọgbọ alá, ọb͕ọ ọzọ abia; ma uwa nēguzoru mb͕e ebighi-ebi. 5 Ọzọ, anyanwu awawo, anyanwu adawo kwa, ọ bu kwa ila n'ọnọdu-ya ka ọ nēkusi ume ike, bú ebe ọ nāwa. 6 Ifufe nēferu Ndida, we nēfe buruburu rue Ugwu; ọ nēfe buruburu mb͕e nile na nfeghari-ya, ọ bu kwa n'ife buruburu ya ka ifufe feghachiworo. 7 Osimiri nile nērùdaru oké osimiri, ma oké osimiri ejughi eju, rue ebe osimiri nērùda, rue ebe ahu ka osimiri ahu nērùghachi ọzọ. 8 Ihe nile nādọb͕u onwe-ha n'ọlu; madu apughi ikwu ya: afọ adighi-eju anya n'ihu ihe, afọ adighi-eju kwa nti n'inu ihe. 9 Ihe ọ bula nke diworo, nke ahu bu ihe nke gādi; ọzọ, ihe ọ bula nke emeworo, nke ahu bu ihe nke agēme: ọ dighi kwa ihe ọhu di n'okpuru anyanwu. 10 Ọ̀ di ihe nke madu nāsi, Le nka, ihe ọhu ka ọ bu? na mb͕e di anya gara aga ka ọ diworo, na mb͕e nile ebighi-ebi nke buru ayi uzọ. 11 Ọ dighi ncheta diri ọb͕ọ mbu nile: ọzọ kwa, ọ dighi ncheta gādiri ọb͕ọ ikpe-azu nile nke gādi n'ọdi-n'iru, n'etiti ndi nādi mb͕e ha gasiri. 12 Mu onwem, bú Onye-nkpọkọta, abuwo eze Israel nime Jerusalem. 13 M'were kwa obim nye ichọ na iledo site n'amam-ihe ihe bayere ihe nile nke emeworo n'okpuru elu-igwe: nke ahu bu nweda-n'ala jọrọ njọ nke Chineke nyeworo umu nke madu ka ewere ya weda ha n'ala. 14 Ahuwom ọlu nile nke aluworo n'okpuru anyanwu; ma, le, ihe nile bu ihe-efu na ichọ ijide ifufe. 15 Ihe nke b͕agọrọ ab͕agọ, apughi ime ka ọ dizie: ọzọ, ihe-nkọnari, apughi iguta ya. 16 Mu onwem kpayere obim uka, si, Mu onwem, le, atukwasiwom n'onwem amam-ihe nke-uku kari onye ọ bula nke burum uzọ nime Jerusalem: e, obim ahuwo amam-ihe na ihe-ọmuma ri nne. 17 M'we were obim nye ima amam-ihe, na ima iwi-ara na nzuzu: amawom na nka bu kwa ichọ ijide ifufe. 18 N'ihi na ọ bu n'ọtutu amam-ihe ka ọtutu nkpasu-iwe di: ọzọ, onye nātukwasi ihe-ọmuma nātukwasi ihe-nb͕u.

Eklisiastis 2

1 Mu onwem siri n'obim, Biko, bia, m'gēji ọṅù nwa gi; gi lekwasi kwa ezi ihe anya: ma, le, nke ahu bu kwa ihe-efu. 2 Ekwurum okwu bayere ichì-ọchì, si, Ọ nāwi ara: m'kwu-kwa-ra okwu bayere ọṅù, si, Gini kwa ka ọ nēme? 3 Eledorom n'obim iji manya-vine me ka obi tọ anu-arum utọ, (ma obim nēdum n'amam-ihe), na ijide nzuzu, rue mb͕e m'gāhu ihe ezi ihe ahu bu nke diri umu madu, bú nke ha gēme n'okpuru elu-igwe ọnu-ọgugu ubọchi ndu-ha. 4 Emerem ka ọlum nile di uku; ewurum onwem ulo di iche iche, kuara onwem ubi-vine di iche iche, 5 mere onwem ubi di iche iche ab͕ara ogige na ogige ọma di iche iche, m'we kua osisi nāmi nkpuru nile di iche iche nime ha: 6 emerem onwem ọdọ-miri, isite na ha de oké ọhia nēpu osisi: 7 ab͕ataram orù-ndikom na ndinyom nēje ozi, umu-ulo di-kwa-ram; ọtutu ihe-nnweta, bú ìgwè ehi na ìgwè ewu na aturu, di-kwa-ram, kari ndi nile burum uzọ nime Jerusalem: 8 achikọta-kwa-ram nye onwem ọla-ọcha na ọla-edo, na ihe nke aka ndi-eze na ala nile m'nāchi achi: edozi-kwa-ram nye onwem ndi-abù ndikom na ndi-abù ndinyom, na ihe-utọ nile nke umu madu, ndi-iko nwayi bara uba nke-uku. 9 M'we di uku, ba kwa uba kari onye ọ bula nke burum uzọ nime Jerusalem: amam-ihem guzo-kwa-ra n'ebe m'nọ. 10 Ma ihe ọ bula anyam abua riọrọ, anapughm ha ihe ahu: eb͕ochighm obim n'ọǹù ọ bula, n'ihi na obim ṅuriri ọṅu site na ndọb͕u nile m'dọb͕uru onwem n'ọlu; nka bu kwa òkèm nke sitere na ndọb͕u nile m'dọb͕uru onwem n'ọlu. 11 Mu onwem we che ọlum nile nke akam abua luru iru, eche-kwa-ram ndọb͕u nke m'dọb͕uru onwem n'ọlu ime iru: ma, le, ihe nile bu ihe-efu na ichọ ijide ifufe, ọ dighi kwa ihe fọduru madu n'okpuru anyanwu. 12 Mu onwem we che iru ihu amam-ihe, na iwi-ara na nzuzu: n'ihi na gini ka madu nke nēso eze n'azu gēme? ọ bu ihe nke ha meworo na mb͕e di anya gara aga. 13 Mu onwem we hu na amam-ihe kariri nzuzu, dika ìhè si kari ọchichiri. 14 Onye mara ihe, anya-ya abua di n'isi-ya, ma onye-nzuzu nējeghari n'ọchichiri: ma mu onwem amawo kwa na otù ndabà nādabàra ha nile. 15 Mu onwem we si n'obim, Dika o si dabàra onye-nzuzu, otú a ka ọ nādabàram, ọbuná mu onwem; ma n'ìhi gini kwa ka mu onwem mara ihe kari? M'we kwue okwu n'obim, si, na nka bu kwa ihe-efu. 16 N'ihi na ọ dighi ncheta diri onye mara ihe, dika ọ nēsighi adiri onye-nzuzu, rue mb͕e ebighi-ebi; n'ihi na ihe nke di na mb͕e di anya gara aga, n'ubọchi nke nābia ha nile gābu ihe echezọrọ echezọ. Ònye mara ihe si kwa aṅa nwua dika onye-nzuzu? 17 M'we kpọ ndu asì; n'ihi na ọ jọrọm njọ, bú ọlu nke aluworo n'okpuru anyanwu: n'ihi na ihe nile bu ihe-efu na ichọ ijide ifufe. 18 Mu onwem kpọ-kwa-ra ndọb͕um nile asì, bú nke mu onwem nādọb͕u onwem n'ọlu n'okpuru anyanwu: n'ihi na m'gārapuru ya madu nke gānọ mb͕e m'gasiri. 19 Ma ònye mara ma ọ gābu onye mara ihe ma-ọbu onye-nzuzu? ma ọ gāchi ndọb͕um nile nke m'dọb͕uworo onwem n'ọlu, na nke m'meworo n'amam-ihe n'okpuru anyanwu. Nka bu kwa ihe-efu. 20 Mu onwem we chigharia ime ka obim ghara inwe ntukwasi-obi bayere ndọb͕u nile nke m'dọb͕ururi onwem n'ọlu n'okpuru anyanwu. 21 N'ihi na madu di nke ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu di n'amam-ihe, na n'ihe-ọmuma, na n'izi-ezi; ma ọ bu madu nke nādọb͕ughi onwe-ya n'ọlu nime ya ka ọ gēnye ya ka ọ buru òkè-ya. Nka bu kwa ihe-efu na ihe ọjọ nke riri nne. 22 N'ihi na gini ka madu nwere na ndọb͕u nile ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, na nime ncheb͕u nke obi-ya, nke ya onwe-ya nādọb͕u onwe-ya n'ọlu nime ya n'okpuru anyanwu? 23 N'ihi na ubọchi-ya nile bu nání ihe-nb͕u, nkpasu-iwe ka nweda-n'ala-ya bu kwa; ọbuná n'abali obi-ya edinaghi iraru ura. Nka bu kwa ihe-efu. 24 Ọ dighi ezi ihe di nime madu nke nēri ihe nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, nēme kwa ka nkpuru-obi-ya hu ezi ihe nime ndọb͕u nke ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu. Nka ka mu onwem hu-kwa-ra, na ọ bu n'aka Chineke ka o sitere. 25 N'ihi na ònye nēri ihe, ma-ọbu ònye nēme ngwa iri ihe karim? 26 N'ihi na ọ bu madu nke di nma n'iru Ya ka Chineke nyeworo amam-ihe, na ihe-ọmuma, na ọṅù: ma ọ bu onye-nmehie ka O nyeworo nweda-n'ala, ichikọta na ikpokọta, ka o we nye onye di nma n'iru Chineke ihe. Nka bu kwa ihe-efu na ichọ ijide ifufe.

Eklisiastis 3

1 Ihe ọ bula nwere oge, mb͕e di-kwa-ra ihe ọ bula anēme n'okpuru elu-igwe: 2 mb͕e imu nwa, na mb͕e inwu anwu; mb͕e iku ihe n'ubi, na mb͕e iropu ihe akuru; 3 mb͕e ib͕u eb͕u, na mb͕e igwọ ọria; mb͕e itikpọ etikpọ, na mb͕e iwu ulo; 4 mb͕e ikwa ákwá, na mb͕e ichì ọchì; mb͕e iru újú, na mb͕e ite egwú; 5 mb͕e itufu nkume, na mb͕e itukọba nkume; mb͕e ib͕aku, na mb͕e inọrọ nb͕aku n'ebe di anya; 6 mb͕e ichọ achọ, na mb͕e ime ka ihe la n'iyì; mb͕e idebe edebe, na mb͕e itufu etufu; 7 mb͕e idọwa adọwa, na mb͕e idukọta adukọta; mb͕e ib͕a nkiti, na mb͕e ikwu okwu; 8 mb͕e ihu n'anya, na mb͕e ikpọ asì; mb͕e agha, na mb͕e udo. 9 Òle ihe fọduru onye nālu ọlu n'ihe nke ya onwe-ya nādọb͕u onwe-ya n'ọlu nime ya? 10 Ahuwom nweda-n'ala nke Chineke nyeworo umu madu iweda ha n'ala nime ya. 11 Ihe nile ọ bula ka O meworo ka ọ ma nma na mb͕e-ya: ọzọ, mb͕e ebighi-ebi ka O tiyeworo n'obi-ha, ma ka O si tiye ya madu agaghi-achọputa ọlu ahu nke Chineke luworo site na nmalite we rue na nsọtu. 12 Amawom na ọ dighi ezi ihe diri ha, ma-ọbughi ka madu ṅuria ọṅu, me kwa ezi ihe n'ogologo ndu-ya. 13 Ọzọ kwa, madu ọ bula nke nēri ihe, nke nāṅu kwa ibe-ọṅuṅu, nke nāhu kwa ezi ihe na ndọb͕u nile ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, onyinye Chineke ka nke ahu bu. 14 Amawom na ihe ọ bula Chineke nēme, nke ahu gādiru mb͕e ebighi-ebi: ọ dighi ihe agātukwasi ya, ọ dighi kwa ihe agēbìlata nime ya: Chineke emewo kwa ya, ka madu we tua egwu n'iru Ya. 15 Ihe ọ bula nke diworo, na mb͕e di anya gara aga ka ọ di; ọzọ, ihe ọ bula nke gādi adi, na mb͕e di anya gara aga ka ọ diworo: Chineke nāchọ kwa ihe achupuru achupu. 16 Ọzọ kwa, m'huru n'okpuru anyanwu ebe ikpé, na ọ bu n'ebe ahu ka nmebi-iwu di; m'hu-kwa-ra ebe ezi omume, na ọ bu n'ebe ahu ka nmebi-iwu di. 17 Mu onwem siri n'obim, Onye ezi omume na onye nēmebi iwu ka Chineke gēkpe: n'ihi na mb͕e diri ihe ọ bula anēme na n'ihi ọlu ọ bula n'ebe ahu. 18 Mu onwem siri n'obim, Ọ bu n'ihi umu madu, ka Chineke we meme ka ha puta ìhè, ka ha we hu kwa, na ha onwe-ha bu anumanu, ha n'onwe-ha. 19 N'ihi na ihe nādabàra umu madu, ihe nādabà-kwa-ra anumanu; ọbuná otù ihe ahu nādabàra ha: dika ọnwu nke anumanu si di, otú a ka ọnwu nke madu di; e, otù mọ ka ha nile nwere; ọ dighi kwa ọkaka madu nwere kari anumanu: n'ihi na ha nile bu ihe-efu. 20 Ha nile nāla n'otù ebe; ha nile siri n'ájá puta, ha nile nālaghachi kwa n'ájá. 21 Ònye mara mọ nke umu madu, ma nke ahu nārigo arigo, na mọ nke anumanu, ma nke ahu nārida n'okpuru rue ala? 22 M'we hu na ọ dighi ihe di ṅma kari ka madu nāṅuri n'ọlu-ya; n'ihi na nke ahu bu òkè-ya: n'ihi na ònye gēme ka ọ biaghachi ilekwasi ihe gādi mb͕e ọ gasiri?

Eklisiastis 4

1 Mu onwem we legharia anya bu nmeb͕u nile anēmeb͕u n'okpuru anyanwu: ma, le, anya-miri nke ndi anēmeb͕u, ma ọ dighi onye-nkasi-obi ha nwere; ma n'akuku ndi nēmeb͕u ha ka ike di, ma ọ dighi onye-nkasi-obi ha nwere. 2 Mu onwem we ja ndi nwuru anwu, bú ndi nwuru anwu na mb͕e di anya gara aga, kari ndi di ndu, bú ndi ahu nke nọ na ndu rue ub͕u a; 3 e, ọ di nma kari ha abua, bú onye akādighi, nke nāhughi ọlu ọjọ nke aluworo n'okpuru anyanwu. 4 Mu onwem we hu ndọb͕u nile madu nādọb͕u onwe-ha n'ọlu, ya na ọlu nile nāgafe agafe, na ọ bu n'ihi nka ka madu gābu onye madu-ibe-ya gēkwoso ekworo. Nka bu kwa ihe-efu na ichọ ijide ifufe. 5 Onye-nzuzu nākpakọba aka-ya abua, nēri kwa anu-aru onwe-ya. 6 Ọ di nma, bú otù nju-aka n'izu-ike, kari nju-aka abua n'idọb͕u onwe-gi n'ọlu na ichọ ijide ifufe. 7 Mu onwem we laghachi, hu ihe-efu n'okpuru anyanwu. 8 Ọ di otù onye nke nání ya di, ọ dighi kwa onye abua ọ nwere; ọ dighi kwa nwa ma-ọbu nwa-nne o nwere; ma ọ dighi nsọtu diri ndọb͕u-ya nile ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, afọ adighi-eju kwa anya-ya n'àkù. Ọ nāsi, Ọ̀ bu kwa n'ihi onye ka mu onwem nādọb͕u onwem n'ọlu, we me ka ezi ihe kọnari nkpuru-obim? Nka bu kwa ihe-efu, e, nweda-n'ala jọrọ njọ ka ọ bu. 9 Abua di nma kari otù; n'ihi na ha nwere ezi ugwọ-ọlu nime ndọb͕u ha nādọb͕u onwe-ha n'ọlu. 10 N'ihi na ọ buru na ha ada, otù nime ha gēme ka ibe-ya bilie: ma ahuhu gādiri onye ahu nke nání ya di mb͕e ọ nāda, ọ dighi kwa onye abua o nwere ime ka o bilie. 11 Ọzọ, ọ buru na madu abua edinakọ, aru gēkpo kwa ha ọku: ma àru otù onye nke nání ya dina gēsi aṅa kpo ọku? 12 Ọ buru kwa na madu enwe ike n'aru otù onye nání ya di, ma otú ọ di, madu abua gēguzo imegide ya; ọzọ, udọ̀ atọ nke atukọtara n'otù, adighi-adọbì ya ngwa ngwa. 13 Ọ di nma, bú nwata nke bu ob͕eye ma ọ mara ihe, kari eze nke bu okenye ma ọ bu onye-nzuzu, onye nāmaghi inara nmata-ihe ọzọ. 14 N'ihi na n'ulo-nkpọrọ ka o siri puta ibu eze; n'ihi na ọbuná n'ala-eze-ya ka amuru ya ob͕eye. 15 Ahurum ihe nile di ndu nke nējeghari n'okpuru anyanwu, na ha di n'akuku nwata, bú nke-abua ahu, nke nēguzo n'ọnọdu ya. 16 Ọ dighi nguta diri ndi-ya nile, bú ndi nile ọ di n'iru ha: ma ndi gādi n'ọdi-n'iru agaghi-aṅuri nime ya. N'ezie nka bu kwa ihe-efu na ichọ ijide ifufe.

Eklisiastis 5

1 Debe ukwu-gi mb͕e i nējeru ulo Chineke; n'ihi na ibiaru nso inu anu di nma kari ichu àjà ndi-nzuzu: n'ihi na ha adighi-ama na ha nēme ihe ọjọ. 2 Ekwela ka ọnu-gi kwue okwu ọsọsọ, eme-kwa-la ka obi-gi me ngwa iweputa okwu n'iru Chineke; n'ihi na Chineke nọ n'elu-igwe, ma gi onwe-gi nọ n'elu-uwa: n'ihi nka me ka okwu-gi di ole-na-ole. 3 N'ihi na nrọ abiawo n'ọtutu ije-ozi, olu onye-nzuzu kwa n'ọtutu okwu. 4 Mb͕e i nēkwe Chineke nkwa, alala azu n'ikwughachi ya; n'ihi na ihe ndi-nzuzu adighi-atọ Ya utọ: ihe i nēkwe na nkwa, kwughachi ya. 5 Ọ di nma ka i ghara ikwe nkwa, kari ikwe nkwa ma i dighi-akwughachi. 6 Ekwela ka ọnu-gi me anu-aru-gi ka o mehie; asi-kwa-la n'iru onye-ozi Chineke, na ọ bu n'amaghi-ama ka emere ya: n'ìhi gini ka Chineke gēwe iwe megide olu-gi, we mebie ọlu nke aka-gi abua? 7 N'ihi na n'ọtutu nrọ na ihe-efu ka ọtutu okwu di kwa: ma tua egwu Chineke. 8 Ọ buru na i hu na anēmeb͕u ob͕eye, na anānapu kwa ikpé ziri ezi na ezi omume n'ike n'ala anāchi achi, ibobo anwula gi n'ihe ahu anēme: n'ihi na otù Onye Nke di elu kari onye di elu nāriba ama; ndi di elu di kwa n'elu ha. 9 Ọzọ, njubiga-ókè nke ala, ọra madu ka ọ diri: ọbuná eze ka ubi nēfè òfùfè. 10 Onye nāhu ego n'anya, ego agaghi-eju ya afọ; ọzọ, onye nāhu inwe ihe bara uba n'anya, ihe onwunwe agaghi-eju ya afọ: nka bu kwa ihe-efu. 11 Mb͕e ezi ihe nāba uba, ndi nēri ya abawo kwa uba: òle ngazi ọ nāgaziri onye-nwe-ya, ma-ọbughi iji anya-ya abua hu ya? 12 Ihe utọ ka ura nke onye nāla ọlu ubi bu, ma ọ bu ihe ntà ma-ọbu ihe riri nne ka o nēri: ma afọ-ojuju nke ọgaranya adighi-ekwe ya araru ura. 13 Ihe ọjọ nke nēb͕u di nke m'huworo n'okpuru anyanwu, bú àkù nke onye-nwe-ya nēdebe imejọ onwe-ya: 14 àkù ahu we la n'iyì site na nweda-n'ala ọjọ; ọ buru kwa na ọ muwo nwa-nwoke, ọ dighi ihe ọ bula di ya n'aka. 15 Dika o siri n'afọ nne-ya puta, puta n'ọtọ, out a ka ogālaghachi di ka ila dika o siri bia, ma ọ dighi ihe ọ bula o gēburu site na ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, nke ọ gēwere n'aka-ya la. 16 Nka bu kwa ihe ọjọ nēb͕u nb͕u, na n'ihe nile dika o siri bia, otú a ka ọ gāla: ọ̀ bu kwa ole ihe fọduru ya na ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu inwe ifufe? 17 Ọzọ, n'ubọchi-ya nile ọ bu n'ọchichiri ka o nēri ihe, anākpasu kwa ya iwe ri nne, o nwe-kwa-ra ọria na iwe. 18 Le, ihe nke mu onwem huworo na ọ bu ezi ihe nke mara nma bu ka madu rie ihe, ka ọ ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, ka ọ hu kwa ezi ihe nime ndọb͕u-ya nile nke ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu nime ya n'okpuru anyanwu, ọnu-ọgugu ubọchi ndu-ya nke Chineke nyeworo ya: n'ihi na nka bu òkè-ya. 19 Ọzọ, madu ọ bula nke Chineke nyeworo àkù na ihe-nkpakọta, onye O mewo-kwa-ra ka o nwe ike iri nime ya, na ibūru òkè-ya, na iṅuri ọṅu nime ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu; nka bu onyinye Chineke. 20 N'ihi na ọ gaghi-echeta ubọchi nile nke ndu-ya ri nne; n'ihi na Chineke nāza ya n'ọṅù obi-ya.

Eklisiastis 6

1 Ihe ọjọ di nke m'huworo n'okpuru anyanwu, ihe riri nne ka ọ bu kwa n'aru madu: 2 madu onye Chineke nēnye àkù na ihe-nkpakọta na nsọpuru, ọ dighi kwa ihe kọnariri nkpuru-obi-ya nime ihe nile nke ọ nāchọsi ike, ma Chineke adighi-eme ka o nwe ike iri nime ya, kama onye ala ọzọ nēri ya; nka bu ihe-efu, ọria ọjọ ka ọ bu kwa. 3 Ọ buru na nwoke amuta ọgu umu ise, di kwa ndu ọtutu arọ, ubọchi nke arọ-ya ewe ba uba, ma afọ adighi-eju nkpuru-obi-ya n'ezi ihe, ọzọ kwa, ọ dighi olìlì diri ya; asiwom, na nwa amukworo amukwo di nma kari ya: 4 N'ihi na n'ihe-efu ka ọ biara, ọ bu kwa n'ọchichiri ka ọ nāla, eji kwa ọchichiri kpuchi aha-ya; 5 ọzọ, ọ hughi anyanwu, ọ maghi kwa ihe ọ bula; izu-ike diri nka kari onye ahu: 6 e, ọ buru na ọ di ndu nnù arọ abua na ọgu iri okpukpu abua, ma ọ hughi ezi ihe: ọ̀ bughi n'otù ebe ka ha nile nāla? 7 Ndọb͕u nile madu nādọb͕u onwe-ya n'ọlu diri ọnu-ya, ma otú ọ di, ọchichọ nkpuru-obi adighi-eju eju. 8 N'ihi na gini ka onye mara ihe nwebigara ókè kari onye-nzuzu? ma-ọbu gini ka onye ewedara n'ala nwere, bú onye mara ijeghari n'iru ndi di ndu? 9 Ọ di nma, bú ihe-ọhuhu nke anya abua, kari njeghari nke nkpuru-obi: nka bu kwa ihe-efu na ichọ ijide ifufe. 10 Ihe nke diworo, ọ bu na mb͕e di anya gara aga ka akpọrọ aha-ya, amawo kwa na nke ahu bu madu: ọ pughi kwa iluso onye ka ya ike ọ̀gù. 11 Ebe ọtutu okwu di nke nēme ka ihe-efu ba uba, gini ka madu nwebigara ókè? 12 N'ihi na ònye mara ihe diri madu nma na ndu-ya, ọnu-ọgugu ubọchi ndu efu ya nke ọ nēme dika onyinyo? n'ihi na ònye gēgosi madu ihe gādi n'okpuru anyanwu mb͕e ọ gasiri?

Eklisiastis 7

1 Ezi aha di nma kari ezi manu-otite nēsì ísì utọ; ọzọ, ubọchi ọnwu madu di nma kari ubọchi amuru ya. 2 Ọ di nma ije n'ulo oruru-újú, kari ije n'ulo ọṅuṅu-manya-vine: n'ihi na nke ahu bu nsọtu madu nile; onye di ndu gētiye kwa ya n'obi-ya. 3 Iru-újú di nma kari ichì-ọchì: n'ihi na esitere n'ijọ-njọ nke iru me ka obi di nma. 4 Obi ndi mara ihe di n'ulo oruru-újú; ma obi ndi-nzuzu di n'ulo ọṅù. 5 Ọ di nma inu ibasi-nba-ike nke onye mara ihe, karia mb͕e madu nānu abù ndi-nzuzu. 6 N'ihi na dika olu ogwu mb͕e ọ nēre ọku n'okpuru ite, otú a ka ichì-ọchì nke onye-nzuzu di: nka bu kwa ihe-efu. 7 N'ezie nmeb͕u nēme ka onye mara ihe ghọ onye-nzuzu; ọzọ, onyinye nēme ka obi amam-ihe la n'iyì. 8 Ikpe-azu ihe di nma kari nmalite-ya: ọ di nma, bú onye mọ-ya nwere ogologo-ntachi-obi, kari onye mọ-ya di elu. 9 Ekwela ka akpasue gi iwe ọsọsọ nime mọ-gi: n'ihi na nkpasu-iwe nwere ọnọdu-ya n'obi ndi-nzuzu. 10 Asila, Gini kpatara ubọchi mbu ji di nma kari ubọchi ndia? n'ihi na i siteghi n'amam-ihe ju ajuju bayere nka. 11 Amam-ihe di nma dika ihe-nketa: e, ọ dikariri ndi nāhu anyanwu anya nma. 12 N'ihi na amam-ihe bu ǹdò, ego bu kwa ǹdò: ma ọkaka nke ihe-ọmuma bu, na amam-ihe nēme ka onye-nwe-ya di ndu. 13 Le ọlu Chineke: n'ihi na ònye puru ime ka ọ dizie, bú ihe O meworo ka ọ b͕agọ? 14 N'ubọchi ọdi-nma-gi nọ n'ọdi-nma, ma n'ubọchi ọdi-njọ le anya: ọbuná otù na nso ibe-ya ka Chineke meworo ha, ka madu we ghara ichọputa ihe ọ bula nke gādi mb͕e ọ gasiri. 15 Ihe nile a ka m'huworo n'ubọchi nile nke ihe-efum: onye ezi omume di nke nāla n'iyì n'ezi omume-ya, onye nēmebi iwu di kwa nke nēme ka ndu-ya di ogologo n'ihe ọjọ ya. 16 Abubigala onye ezi omume ókè; eme-kwa-la onwe-gi onye mabigara ihe ókè: n'ìhi gini ka i gēmebi onwe-gi? 17 Emebibigala iwu ókè, abu-kwa-la onye-nzuzu: n'ìhi gini ka i gānwuchu anwuchu? 18 Ọ di nma ka i jide nka; ọzọ kwa, esepula aka-gi na nka: n'ihi na onye nātu egwu Chineke gāputa n'etiti ha nile. 19 Amam-ihe nēme ka onye mara ihe di ike kari madu iri ndi nāchi achi ndi nọ n'obodo. 20 N'ezie ọ dighi onye ezi omume n'uwa, nke nēme ezi ihe, nādighi-emehie kwa. 21 Ọzọ, atukwasila obi-gi n'okwu nile anēkwu; ka i we ghara inu ka orù-gi nākọcha gi: 22 N'ihi na ọtutu mb͕e obi-gi maworo na gi onwe-gi akọchawo ndi ọzọ. 23 Ihe nile a ka m'nwaworo n'amam-ihe: m'siri, M'gāma ihe; ma nke ahu di anya n'ebe m'nọ. 24 Ọ di anya, bú ihe nke diworo, o mi-kwa-ra emi nke-uku; ònye gāchọputa ya? 25 M'chighariri, mu onwem na obim, ima na iledo, na ichọsi amam-ihe na ichè-èchìchè ike, na ima na nmebi-iwu bu nzuzu, ima kwa na nzuzu bu iwi-ara: 26 mu onwem achọtawo kwa ihe di ilu kari ọnwu, bú nwayi ahu nke obi-ya bu ọnyà ọnyà na ub͕u ub͕u, ab͕u ka aka-ya abua bu: onye di nma n'iru Chineke gēsi n'aka nwayi ahu wepuga onwe-ya; ma ọ gānwude onye-nmehie. 27 Le, nka ka m'chọtaworo, ka Onye-nkpọkọta siri, nātukwasi otù ihe n'ihe ọzọ, ichọta ichè-èchìchè: 28 nke nkpuru-obim nọ nāchọsi ike rue ub͕u a, ma achọputaghm ya: otù madu n'etiti nnù madu abua na ọgu iri ka m'chọtaworo; ma ọ dighi otù nwayi nime ndi ahu nile ka m'chọtaworo. 29 Le, nání nka ka m'chọtaworo, na Chineke mere madu ka o zie ezi; ma ha onwe-ha achọputawo ọtutu ihe echèputara.

Eklisiastis 8

1 Ònye di ka onye mara ihe? ònye nāma kwa akukọ-isi okwu? Amam-ihe madu nēnye iru-ya ìhè, ike nke iru-ya nāb͕anwe kwa. 2 Mu onwem nādu gi ọdu, Debe okwu-ọnu eze, ọbuná n'ihi ọṅuṅu-iyi Chineke. 3 Esila n'iru ya pua ọsọsọ; eguzola n'ihe ọjọ: n'ihi na ihe ọ bula nke nātọ ya utọ ka ọ nēme. 4 N'ihi na okwu eze nwere ike; ònye gāsi kwa ya, Gini ka i nēme? 5 Onye nēdebe ihe enyere n'iwu agaghi-ama ihe ọjọ; ọzọ, mb͕e na ikpé ka obi onye mara ihe nāmata. 6 N'ihi na ihe ọ bula anēme eme nwere mb͕e na ikpé; n'ihi na ọnọdu ọjọ madu riri nne n'aru ya: 7 n'ihi na ọ dighi-ama ihe gādi adi; n'ihi na ònye gēgosi ya otú ọ gādi? 8 Ọ dighi madu ọ bula nwere ike n'aru mọ ib͕ochi mọ; ọ dighi kwa ike o nwere n'aru ubọchi ọnwu; ọ dighi kwa nzilaga di n'agha ahu: nmebi-iwu agaghi-eme ka onye-nwe-ya wepuga onwe-ya. 9 Ihe nile a ka m'huworo, m'we nye obim ilu ọlu ọ bula nke aluworo n'okpuru anyanwu: mb͕e di mb͕e otù madu nwere ike n'aru madu-ibe-ya imejọ ya. 10 N'uzọ di otú a m'hu-kwa-ra ndi nēmebi iwu ka elìri ha, ha we ba n'ílì; ha we si n'ebe nsọ la, ewe chezọ ha n'obodo ebe ha mere otú a: nka bu kwa ihe-efu. 11 N'ihi na emeghi ihe ekpere n'ikpe megide ọlu ọjọ ọsọsọ, n'ihi nka obi umu madu juru eju nime ha ime ihe ọjọ. 12 Asi na onye-nmehie eme ihe ọjọ ọgu ub͕ò ise, me kwa ka ubọchi-ya di ogologo, ma mu onwem mara n'ezie na ọ gādiri ndi nātu egwu Chineke nma, bú ndi nātu egwu n'iru Ya: 13 ma ọ gaghi-adiri onye nēmebi iwu nma, ọ gaghi-eme kwa ka ubọchi-ya di ogologo, bú nke di ka onyinyo; n'ihi na ọ dighi-atu egwu n'iru Chineke. 14 Ihe-efu di nke anēme n'elu uwa; na ndi ezi omume di, ndi ọ nādakwasi dika ọlu ndi nēmebi iwu si di; ọzọ, ndi nēmebi iwu di, ndi ọ nādakwasi dika ọlu ndi ezi omume si di: m'siri na nka bu kwa ihe-efu. 15 Mu onwem we ja ọṅù, n'ihi na ọ dighi ezi ihe madu nwere n'okpuru anyanwu ma-ọbughi iri ihe, na iṅu ihe-ọṅuṅu, na iṅuri ọṅu: n'ihi na nke ahu gārapara n'aru-ya nime ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu ubọchi nile nke ndu-ya nke Chineke nyeworo ya n'okpuru anyanwu. 16 Mb͕e m'were obim nye ima amam-ihe, na ihu nweda-n'ala nke anēme n'elu uwa: (n'ihi na madu di kwa nke nādighi-ahu urá n'anya-ya abua ma ọ bu n'ehihie ma-ọbu n'abali: ) 17 m'we hu ọlu nile nke Chineke, na madu apughi ichọputa ọlu nke aluworo n'okpuru anyanwu: n'ihi na ọ buru na madu adọb͕u onwe-ya n'ọlu n'uzọ nile ichọ ya, ma ọ gaghi-achọputa ya; ọzọ kwa, ọ buru na onye mara ihe asi na ọ gāma ya, ọ pughi ichọputa ya.

Eklisiastis 9

1 N'ihi na ihe nile a ka m'tiyere n'obim, ọbuná iledo ihe nile a; na ndi ezi omume, na ndi mara ihe, na òfùfè-ha nile, di n'aka Chineke: ma ọ bu ihu-n'anya ma-ọbu ikpọ-asì, madu adighi-ama ya; ihe nile di n'iru ha. 2 Ihe nile nādakwasi madu nile n'otù uzọ ahu: otù ndabà nādabàra onye ezi omume, dabà-kwa-ra onye nēmebi iwu; ọ nādabàra ezi madu, dabà-kwa-ra onye di ọcha, dabà-kwa-ra onye nādighi ọcha; ọ nādabàra onye nāchu àjà, dabà-kwa-ra onye nādighi-achu àjà: dika ezi madu si di, otú a ka onye-nmehie di kwa; onye nāṅu iyi di ka onye nātu egwu ọṅuṅu-iyi. 3 Nka bu ihe ọjọ n'ihe nile anēme n'okpuru elu-igwe, na otù ndabà nādabàra madu nile: ọzọ kwa, obi umu madu juputara n'ihe ọjọ, iwi-ara di kwa n'obi-ha mb͕e ha nọ na ndu, ma emesia ha nālakuru ndi nwuru anwu. 4 N'ihi na onye ọ bula nke ejikọtaworo ya na ndi nile di ndu, o nwere ntukwasi-obi: n'ihi na ọ diri nkita di ndu nma kari ọdum nwuru anwu. 5 N'ihi na ndi di ndu mara na ha gānwu: ma ndi nwuru anwu adighi-ama ihe ọ bula, ọ dighi kwa ugwọ-ọlu ha nwere ọzọ; n'ihi na echezọwo ncheta-ha. 6 Ma ihu-n'anya-ha, ma ikpọ-asì-ha, ma ekworo-ha, na mb͕e di anya gara aga ka ọ laworo n'iyì; ọ dighi kwa òkè ha nwere ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi n'ihe ọ bula nke emeworo n'okpuru anyanwu. 7 Je, were ọṅù rie nri-gi, were kwa obi di nma ṅua manya-vine-gi; n'ihi na ọlu-gi nile atọwo Chineke utọ na mb͕e di anya gara aga. 8 Ka uwe-gi nile di ọcha mb͕e nile; ka manu-otite nke nēsi ísì utọ ghara kwa ikọnari isi-gi. 9 Di ndu ọṅù, gi na nwunye nke i huru n'anya, ubọchi nile nke ndu ihe-efu-gi, nke O nyeworo gi n'okpuru anyanwu, ubọchi nile nke ihe-efu-gi: n'ihi na nke ahu bu òkè-gi na ndu, na nime ndọb͕u-gi nke gi onwe-gi nādọb͕u onwe-gi n'ọlu n'okpuru anyanwu. 10 Ihe ọ bula aka-gi nāhu ime, were ike-gi me ya; n'ihi na ọ dighi ọlu, ma-ọbu ichè-èchìchè, ma-ọbu ihe-ọmuma, ma-ọbu amam-ihe, di n'ala-mọ, ebe gi onwe-gi nāla. 11 M'laghachiri, hu n'okpuru anyanwu, na ọ bughi ndi nwere ukwu ọsọ ka iwu-ọsọ diri, ọ bughi kwa ndi di ike ka agha diri, ọzọ kwa, ọ bughi ndi mara ihe ka nri diri, ọzọ kwa, ọ bughi ndi-nghọta ka àkù diri, ọzọ kwa, ọ bughi ndi-ǹkà ka amara diri; kama mb͕e na ihe-ndaputa nādabàra ha nile. 12 N'ihi na ọbuná madu adighi-ama mb͕e-ya: dika azù nke anānwude n'ub͕u ọjọ, na dika umu nnunu nke nāma n'ọnyà, dika ndia ka umu madu nāma n'ọnyà na mb͕e ọjọ, mb͕e ọ nādakwasi ha na mberede. 13 Otú a kwa ka m'huworo amam-ihe n'okpuru anyanwu, ihe uku ka ọ burum: 14 otù obodo ntà di, ndikom di nime ya di kwa ole-na-ole; ma otù eze uku biara imegide ya, we b͕a ya buruburu, wu kwa ebe ewusiri ike imegide ya: 15 ma achọputara nime ya otù nwoke bu ob͕eye nke mara ihe, onye ahu we me ka obodo ahu wepuga onwe-ya site n'amam-ihe-ya; ma madu echetaghi nwoke ahu bu ob͕eye. 16 Mu onwem we si, Amam-ihe di nma kari idi-ike: ma amam-ihe nke ob͕eye ahu bu ihe anēleda anya, adighi-anu kwa okwu-ya nile. 17 Okwu nke ndi mara ihe anēkwu na nwayọ, anānu ha kari iti-nkpu nke onye nāchi achi n'etiti ndi-nzuzu. 18 Amam-ihe di nma kari ihe-agha nile: ma otù onye-nmehie nāla ọtutu ezi ihe n'iyì.

Eklisiastis 10

1 Ijiji nwuru anwu nēme ka manu onye nāsugwa manu-otite nke nēsì ísì utọ sìe ísì ọjọ, re kwa ure: otú a ka nzuzu ntà di arọ́ kari amam-ihe, kari kwa nsọpuru. 2 Obi onye mara ihe di n'aka-nri-ya; ma obi onye-nzuzu di n'aka-ekpe-ya. 3 Ọzọ kwa, mb͕e onye-nzuzu nēje ije n'uzọ, obi-amam-ihe-ya nākọnari ya, ọ we si madu nile na onye-nzuzu ka ọ bu. 4 Ọ buru na mọ nke onye nāchi achi ebilie imegide gi, arapula ọnọdu-gi; n'ihi na ime-nwayọ nēme ka nmehie uku di iche iche kwusi. 5 Ihe ọjọ di nke m'huworo n'okpuru anyanwu, ọ di ka ihe emere n'amaghi-ama nke nēsi n'aka onye nāchi achi aputa: 6 etiyere nzuzu n'ebe di iche iche di elu ri nne, ma ndi-ọgaranya nānọdu n'ebe di ala. 7 Ahuwom ndi-orù ka ha nānọkwasi n'inyinya, ahuwokwam ndi-isi ka ha nējeghari dika ndi-orù n'elu uwa. 8 Onye nēgwu olulu, nime ya ka ọ gādabà; ọzọ, onye nētipú mb͕idi, agwọ gāta ya aru. 9 Onye nēbupu nkume, o gēb͕u ya nb͕u site na ha; onye nāwa osisi nọ n'ize-ndu site na ya. 10 Ọ buru na ígwè anyua nkọ, ma onye ahu amughi iru-ya amu, ọ gētiye kwa ike kari: ma amam-ihe nāba urù ime ka ihe nāgazi agazi. 11 Ọ buru na agwọ ata aru tutu arà ya urà, ọ dighi kwa urù ọ gābara onye-nwe ire-utọ. 12 Okwu nile nke ọnu onye mara ihe di amara; ma eb͕ub͕ere-ọnu nke onye-nzuzu gēloda ya onwe-ya. 13 Nmalite okwu nile nke ọnu-ya bu nzuzu: nkwubì okwu-ọnu-ya bu kwa iwi-ara ọjọ. 14 Onye-nzuzu nēme kwa ka okwu ba uba: madu adighi-ama ihe ọ bula nke gādi adi; ọzọ, ihe gādi mb͕e ọ gasiri, ònye gēgosi ya? 15 Ndọb͕u nke ndi-nzuzu nādọb͕u onwe-ha n'ọlu nāgwu onye ọ bula nime ha ike, n'ihi na ọ maghi ijeru obodo. 16 Ahuhu gādiri gi, ala, mb͕e eze-gi bu nwata, mb͕e ndi-isi-gi nēri kwa ihe n'ututu! 17 Ihe nāgara gi nke-ọma, ala, mb͕e eze-gi bu nwa ndi amara aha-ha, mb͕e ndi-isi-gi nēri kwa ihe na mb͕e oriri, n'ihi idi-ike, ọ bughi kwa n'ihi iṅubiga-manya-ókè! 18 Site n'okè ume-ngwu ka elu ulo nēze eze; site kwa n'ifanye aka n'ukwu ka ulo nēhi mmiri. 19 N'ihi ichì-ọchì ka anēsi nri, manya-vine nēme ka ndu ṅuria: ego nāza kwa ihe nile. 20 Ọbuná n'uche-gi akọchala eze; akọcha-kwa-la ọgaranya n'ime-ulo-ndina-gi: n'ihi na anu-ufe nke elu-igwe gēme ka olu-gi rue ya nti, ihe nwere nkù gēgosi kwa okwu ahu.

Eklisiastis 11

1 Zipu nri-gi n'elu miri: n'ihi na mb͕e ọtutu ubọchi gasiri i gāhu ya. 2 Nye asa òkè, e, nye kwa asatọ; n'ihi na i maghi ihe ọjọ di aṅa gādi n'uwa. 3 Ọ buru na igwe-oji ejuputa na miri-ozuzo, n'ala ka ha nāwusa onwe-ha: ọ buru kwa na osisi ada na Ndida, ma-ọbu n'Ugwu, n'ebe osisi ahu nāda, n'ebe ahu ka ọ gādigide. 4 Onye nāriba ifufe ama agaghi-agha nkpuru; ọzọ, onye nēlekwasi igwe-oji anya agaghi-ewe ihe-ubi. 5 Dika i nēsighi ma ihe bu uzọ ifufe, ma-ọbu otú ọkpukpu nile si etó n'afọ nwanyi di ime; ọbuná otú a i dighi-ama ọlu Chineke Nke nēme ha nile. 6 Gha nkpuru-gi n'ututu, ewepu-kwa-la aka-gi n'anyasi: n'ihi na i dighi-ama nke gāgazi agazi, ma ọ bu nka ma-ọbu nke-ọzọ, ma-ọbu na ha abua gādi nma otù aka ahu. 7 Ọzọ, ìhè di utọ, ọ di-kwa-ra anya abua nma ihu anyanwu. 8 E, ọ buru na madu adi ndu ọtutu arọ, ya ṅuria nime ha nile; ma ya cheta ubọchi nile nke ọchichiri, n'ihi na ha gāba uba. Ihe nile nke nābia bu ihe-efu. 9 Ṅuria, nwa-okorọbia, na nwata i bu; ka obi-gi me kwa gi nma n'ubọchi nile nke okorọbia i bu, je kwa ije n'uzọ nile nke obi-gi, na n'ọhuhu-uzọ nke anya-gi abua: ma mara na n'ihi ihe ndia nile Chineke gēme ka i ba n'ikpé. 10 Ma wezuga nkpasu-iwe n'obi-gi, me kwa ka ihe ọjọ si n'anu-aru-gi gabiga: n'ihi na okorọbia na mb͕e-dìnkpà bu ihe-efu.

Eklisiastis 12

1 Cheta kwa Onye kèworo gi n'ubọchi nile i di n'okorọbia, mb͕e ubọchi ihe ọjọ akābiaghi, na mb͕e arọ akābiarughi nso, mb͕e i gāsi, Ha atọghim utọ; 2 mb͕e anyanwu na ìhè na ọnwa na kpakpando nile akāb͕achighi, igwe-oji we lata mb͕e oké miri zosiri: 3 n'ubọchi ahu mb͕e ndi nēdebe ulo gāma jijiji, mb͕e ndi bu dìnkpà gērulata onwe-ha, mb͕e ndinyom nke nēgwe nri gākwusi n'ihi na ha di ole-na-ole, mb͕e agēme ka anya b͕achie ndinyom nēsi na window elepu anya, 4 mb͕e agēmechi uzọ n'amá; mb͕e olu ogwugwe-nri gāla ala, mb͕e madu gēbili n'urá n'olu nnunu, mb͕e ndinyom nile nke nābù abù gādi ala ala; 5 ọzọ, ha gātu egwu ihe di elu, ihe-ujọ di iche iche gādi kwa n'uzọ; osisi almond gāb͕ọwa kwa okoko-ya, ukpala gāghọ kwa ibu, ọchichọ gāgwu kwa: n'ihi na madu nāla n'ulo ebighi-ebi ya, ndi nēti aka n'obi ewe jegharia n'amá buruburu: 6 mb͕e akātọpughi udọ̀ ọla-ọcha, mb͕e akētiwaghi kwa ọkwa ọla-edo, mb͕e ite akādawaghi kwa n'isi-iyi, mb͕e akētiwaghi kwa wheel n'olùlù-miri; 7 ájá ewe laghachi n'ala dika o si diri, mọ alaghachikuru kwa Chineke Onye nyere ya. 8 Ihe-efu kachasi ihe-efu nile, ka Onye-nkpọkọta siri; ha nile bu ihe-efu. 9 Ma tukwasi nka, n'ihi na Onye-nkpọkọta mara ihe, ọ nọ nēzí ndi-ya ihe-ọmuma; ọ ṅa-kwa-ra nti, we gwuputa, me ka ọtutu ilu dizie. 10 Onye-nkpọkọta chọrọ ichọputa okwu nile nātọ utọ, na ihe edeziri edezi, bú okwu nile nke ezi-okwu. 11 Okwu nile nke ndi mara ihe di ka ndudu eji achu ehi, ọzọ, dika ǹtú akumiri nke-ọma ka okwu nke ndi-nwe nzukọ di, bú okwu enyere site n'aka otù onye-ọzùzù-aturu. 12 Tukwasi kwa n'ihe ndia, nwam, nara ndum-ọdu: ime ọtutu akwukwọ enweghi ọgwugwu; ọtutu nmuta bu kwa ike-ọgwugwu nke anu-aru. 13 Ka ayi nuru nkwubì okwu a nile: tua egwu Chineke, debe kwa ihe nile Ọ nyere n'iwu; n'ihi na nka bu ọlu madu nile. 14 N'ihi na ọlu ọ bula ka Chineke gēme ka ọ ba n'ikpé, ya na ihe ọ bula zoro ezo, ma ọ bu ezi ihe ma-ọbu ihe ọjọ.

Abù Nke Abù 1

1 Abù nke abù, nke diri Solomon. 2 Ya were nsutu nile nke ọnu-ya sutum: N'ihi na ihu-n'anya-gi nile di nma kari manya-vine. 3 Manu-otite-gi nile nēsì ísì ọma; Manu-otite nke nēsì ísì utọ nke awusiri awusi ka aha-gi bu; N'ihi nka ka umu-ab͕ọghọ huworo gi n'anya. 4 Dọrọm; gi ka ayi gāb͕aso: Eze emewo ka m'ba n'ime-ulo-ya: Ayi gēteghari egwú ọṅù ṅuri kwa nime gi, Ayi gēhota ihu-n'anya-gi nile kari manya-vine: N'izi-ezi nile ka ha huworo gi n'anya. 5 Onye oji ka m'bu, ma amaram nma, Unu umu-ndinyom Jerusalem, Dika ulo-ikwū nile nke Kida, Dika ákwà-nkwuba nile nke Solomon. 6 Elelam anya, n'ihi na mu onwem nēji nji, N'ihi na anyanwu achawom. Umu nke nnem wesaram iwe di ọku, Ha dorom onye-nche ubi-vine-ha nile; Ma ubi-vine nkem, nke m'nwere, ka m'nēcheghi. 7 Gosim, gi onye nkpuru-obim huworo n'anya, Ebe i nāzù ìgwè aturu-gi, ebe i nēme ka ha makpu n'etiti-ehihie: N'ihi na ọ̀ bu n'ihi gini ka m'gādi ka nwanyi ekpuchiri ekpuchi, N'akuku ìgwè aturu nile nke ndi ejikọtara gi na ha? 8 Ọ buru na i maghi, gi onye mara nma n'etiti ndinyom, Puara onwe-gi so na nzọ-ukwu nile nke ìgwè ewu na aturu, Zù kwa umu-ewu-gi n'akuku ebe-obibi nile nke ndi-ọzùzù-atutu. 9 Inyinyam nke di n'ub͕ọ-ala FeroKa m'wereworo gi tuara, gi eyìm. 10 Ntì-gi abua mara nma n'agiri-isi akpara akpa, Olu-gi mara nma n'ihe di oké ọnu-ahia agara aga. 11 Ihe-ọkpukpa di iche iche nke ọla-edo ka ayi gēmere gi, Ya na nkpọchi ọla-ọcha. 12 Mb͕e eze nọ n'oche-ya di buruburu, Manu nard nkem sìpuru ísì utọ ya. 13 Ùkwù myrrh ka onye ihe-ya nātọm utọ burum, N'etiti aram abua ka ọ nānọ ọnọdu-abali. 14 Uyọkọ nke okoko henna ka onye ihe-ya nātọm utọ burumN'ubi-vine nke En-gedi. 15 Le, i mara nma, eyìm; le, i mara nma; Anya-gi abua di ka nduru. 16 Le, i mara nma, gi onye ihe-gi nātọm utọ, e, i di utọ: Ọzọ, ebe ayi nēdina nācha akwukwọ ndu. 17 Ntuhie nile nke ulo-ayi nile bu cedar, Age-ulo-ayi nile bu asisi fir.

Abù Nke Abù 2

1 Mu onwem bu rose nke Sheron, Abum urodi nke ndagwurugwu. 2 Dika urodi n'etiti ogwu, Otú a ka eyìm di n'etiti umu-ndinyom. 3 Dika osisi apple n'etiti osisi oké ọhia, Otú a ka onye ihe-ya nātọm utọ di n'etiti umu-ndikom. Ǹdò-ya ka m'chọsiworo ike, m'we nọdu ala, Nkpuru-ya tọ-kwa-ra okpo-ọnum utọ. 4 O mere ka m'bata n'ulo manya-vine, Ọkọlọtọ-ya n'elum bu kwa ihu-n'anya. 5 Werenu mbadamba nkpuru-vine amiri ami b͕am ume, werenu nkpuru-osisi apple me ka arum di ike: N'ihi na onye nāria ọria ihu-n'anya ka m'bu. 6 Aka-ekpe-ya di n'okpuru isim, Aka-nri-ya nāb͕akum. 7 Unu umu-ndinyom Jerusalem, Ejim nne-mb͕ada nile, ejikwam nne-ele ọhia nile, b͕a unu iyi, Unu akpọtela, unu eme-kwa-la ka ihu-n'anya teta, ma ọli, Rue mb͕e ọ gātọ ya utọ. 8 Ọ bu olu onye ihe-ya nātọm utọ! le kwa, ọ nābia, Nāmali elu n'elu ugwu nile, nāwuli elu n'elu ugwu ntà nile. 9 Onye ihe-ya nātọm utọ yiri mb͕ada ma-ọbu nwa-ele: Le kwa, ọ nēguzo n'azu mb͕idi-ayi, Ọ nēsi na window nile lebata anya, Anya-ya nēsi n'oghere-inara-ifufe nwubata. 10 Onye ihe-ya nātọm utọ zara, sim, Bilie, eyìm, onye nkem nke mara nma, bia. 11 N'ihi na, le, mb͕e oyi agabigawo, Oké miri-ozuzo agawo, ọ lawo; 12 Ahuwo okoko-ọhia anya n'ala; Mb͕e abù ọma nke umu-nnunu eruwo, Anuwo kwa olu nduru n'ala-ayi; 13 Osisi fig achawo nkpuru fig-ya nāchaghi acha, Osisi vine nile nāb͕awa okoko, Ha esìpuwo ísì utọ ha. Bilie, eyìm, onye nkem nke mara nma, bia. 14 Gi ndurum, nke di na nb͕awa nkume di elu, n'ebe-nzuzo nke ebe di nkputankpu, Me ka m'hu iru-gi, me ka m'nu olu-gi; N'ihi na olu-gi nātọ utọ, iru-gi ma-kwa-ra nma. 15 Nwuderenu ayi nkita-ọhia nile, bú nkita-ọhia di ntà, ndi nēmebi ubi-vine nile; N'ihi na ubi-vine-ayi nāb͕awa okoko. 16 Onye ihe-ya nātọm utọ bu nkem, mu onwem bu kwa nke ya: Bú onye ahu nke nāzù ìgwè aturu-ya n'etiti urodi. 17 Rue mb͕e ifufe anyasi nēfe n'ubọchi, mb͕e onyinyo nile nāb͕alaga kwa, Chigharia, gi onye ihe-gi nātọm utọ, me onwe-gi ka i yie mb͕ada ma-ọbu nwa-eleN'elu ugwu nile nke Beta.

Abù Nke Abù 3

1 N'elu ihe-ndinam n'abali ka m'chọrọ onye ahu nke nkpuru-obim huru n'anya: Achọrọm ya, ma achọtaghm ya. 2 M'siri, Biko, ka m'bilie, jegharia n'obodo buruburu, N'amá nile na n'ebe nile sara mbara, Ka m'chọ onye ahu nke nkpuru-obim huru n'anya: Achọrọm ya, ma achọtaghm ya. 3 Ndi-nche ndi nējeghari n'obodo buruburu hurum: M'we si ha, Ùnu ahuwo onye ahu nke nkpuru-obim huru n'anya? 4 Ọ bu nání nwantī ka m'siri n'ebe ha nọ gabiga, Mb͕e m'chọtara onye ahu nke nkpuru-obim huru n'anya: Ejiderem ya, arakwaghm ya aka, Rue mb͕e m'mere ka ọ ba n'ulo nnem, Na n'ime-ulo nke nwayi turu imem. 5 Unu umu-ndinyom Jerusalem, Ejim nne-mb͕ada nile, ejikwam nne-ele ọhia nile, b͕a unu iyi, Unu akpọtela, unu eme-kwa-la ka ihu-n'anya teta, ma-ọli, Rue mb͕e ọ gātọ ya utọ. 6 Ọnye bu nka nke nēsi n'ọzara arigota dika ogidi di iche iche nke anwuru-ọku, Nke anēsurere ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, bú myrrh na frankincense, Site n'ihe nile egwere egwe nke onye-ahia? 7 Le, ọ bu ihe-ndina-ya, bú nke Solomon nwere; Ọgu ndi-dike atọ di ya buruburu, Site na ndi-dike nke Israel. 8 Ha nile ji mma-agha, ha bu ndi emeworo ka ha muta ibu agha: Onye ọ bula, mma-agha-ya di n'úkwù-ya, N'ihi egwu n'abali. 9 Eze, bú Solomon, emeworo onwe-ya otù palanquinSite n'osisi Lebanon. 10 Ogidi-ya nile ka o jiri ọla-ọcha me, Ala-ya ka o jiri ọla-edo me, ebe-ọnọdu-ya ka o jiri ogho ododo me, Etiti-ya, eji ihu-n'anya me ka ọ buru pavement ọma, Site n'aka umu-ndinyom Jerusalem. 11 Puanu, umu-ndinyom Zaion, lekwasi Solomon, bú eze, anya, Ka o kpuru okpu-eze nke nne-ya kpubeworo ya n'ubọchi ọlulu-nwunye-ya, Na n'ubọchi ọṅù nke obi-ya.

Abù Nke Abù 4

1 Le, i mara nma, eyìm, le, i mara nma; Anya-gi abua di ka nduru n'azu ákwà-nkpuchi-gi: Agiri-isi-gi di ka ìgwè ewu, Nke nēdina ala n'akuku ugwu Gilead. 2 Ezé-gi di ka ìgwè nne-aturu nke akpachaworo aji-ha ọhu, Nke siworo n'isa-aru rigota; Nke ha nile chi umu abua umu abua, Ọ dighi kwa nke b͕a aka nwa n'etiti ha. 3 Dika ogho uhie ka eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua bu, Okwu-ọnu-gi ma-kwa-ra nma: Dika iberibe pomegranate ka akuku egedege-iru-gi buN'azu ákwà-nkpuchi-gi. 4 Dika ulo-elu Devid, nke ewuru idebe ihe-agha, otú a ka olu-gi di, Nke ekobeworo nnù ọta abua na ọgu iri, Bú ọta ntà nile nke ndi-dike. 5 Ara-gi abua di ka umu-mb͕ada abua nke bu umu abua nke otù nne-mb͕ada muru, Nke nāta nri n'etiti urodi. 6 Rue mb͕e ifufe anyasi nēfe n'ubọchi, mb͕e onyinyo nile nāb͕alaga kwa, Mu onwem gēje n'ugwu myrrh, Na n'ugwu ntà frankincense. 7 I mazuru nma, eyìm; Ọ dighi kwa ntupọ di n'aru-gi. 8 Si na Lebanon som, nwunye ọhu nkem, Si na Lebanon som: Site n'elu Amana le anya, Site n'elu Senia na Heamon, Site n'ebe-obibi nile nke ọdum. Site n'ugwu nile nke agu. 9 I riwo obim, nwa-nnem nwayi; I werewo otù nime anya-gi abua, I werewo kwa otù ihe-inya-n'olu site n'olu-gi, rie obim. 10 Le ka ihu-n'anya-gi nile si ma nma nke-uku, nwa-nnem nwayi, nwunye ọhu nkem! Le ka ihu-n'anya-gi nile si di nma nke-uku kari manya-vine! Le kwa ka ísì utọ nke manu-gi nile di nma nke-uku kari uda nile! 11 Manu-aṅu nke si n'ub͕ub͕ọ-manu-aṅu abusi ka eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua nābusi, nwunye ọhu nkem: Manu-aṅu na miri-ara-ehi di n'okpuru ire-gi; Ísì utọ nke uwe-gi nile di kwa ka ísì utọ Lebanon. 12 Ubi ab͕ara ogige nke akpachiri akpachi ka nwa-nnem nwayi, bú nwunye ọhu nkem, bu; Ebe-nsuputa-miri akpachiri akpachi, isi-iyi ab͕achiri ab͕achi. 13 Ome-gi nile bu ogige ọma nke pome-granate, nwere nkpuru di iche iche di oké ọnu-ahia; Henna, ya na osisi manu nard nile, 14 Manu nard na saffron, Calamus na cinnamon, ha na osisi nile nke frankincense; Myrrh na aloes, ha na isi uda nile. 15 Isi-iyi nke ubi nile ab͕ara ogige ka i bu, Olùlù-miri nke juputara na miri di ndu, Na miri-iyi di iche iche nke nērù erù site na Lebanon. 16 Teta, gi ifufe Ugwu; bia kwa, gi ifufe Ndida; Fekwasi ubim ab͕ara ogige, ka uda-ya di iche iche we rùpu. Ka onye ihe-ya nātọm utọ bata n'ubi-ya ab͕ara ogige, We rie nkpuru-ya di iche iche nke di oké ọnu-ahia.

Abù Nke Abù 5

1 Abatawom n'ubim ab͕ara ogige, nwa-nnem nwayi, nwunye ọhu nkem: Aghọrọwom myrrh nkem, ya na udam; Arachawom ub͕ub͕ọ-manu-aṅum, ya na manu-aṅum; Aṅuwom manya-vine nkem, ya na miri-ara-ehim. Rienu ihe, ndi-eyim; Ṅuanu ihe-ọṅuṅu, e, ṅujuenu afọ unu ndi ihe-unu nātọm utọ. 2 Mu onwem nāraru ura, ma obim nēteta: Ọ bu olu nke onye ihe-ya nātọm utọ nāku aka n'uzọ, si, Megherem uzọ, nwa-nnem nwayi, eyìm, ndurum, onye nkem nke zuru okè: N'ihi na isim juputara n'igirigi, Agiri-isim juputara n'ọbubu-miri nke abali. 3 Eyipuwom uwem; #m'gēsi aṅa yiri ya? Asawom ukwum abua; #m'gēsi aṅa me ka ha rue inyi? 4 Onye ihe-ya nātọm utọ setipuru aka-ya tiye n'oghere uzọ, Afọm we me nkpatu n'ihi ya. 5 Mu onwem biliri imeghere onye ihe-ya nātọm utọ uzọ; Akam abua nābusi kwa na myrrh, Nkpisi-akam nile nābusi kwa na myrrh nērù erù, N'elu nkpisi nile nke ugodi. 6 Mu onwem meghere onye ihe-ya nātọm utọ uzọ; Ma onye ihe-ya nātọm utọ wezugarari onwe-ya, gabiga. Nkpuru-obim apuwori mb͕e o kwuru okwu: Achọrọm ya, ma Achọtaghm ya; Akpọrọm ya òkù, ma ọ zaghm. 7 Ndi-nche ndi nējeghari n'obodo buruburu hurum, Ha tirim ihe, b͕uem mma; Ndi-nche mb͕idi nile nke obodo chipuru ákwà-nb͕ochim n'arum. 8 Ab͕awom unu iyi, unu umu-ndinyom Jerusalem, ọ buru na unu ahu onye ihe-ya nātọm utọ, Gini ka unu gēgosi ya? Na onye ọria ihu-n'anya nāria ka m'bu. 9 Gini ka onye ihe-ya nātọ gi utọ bu kari onye ọzọ ihe-ya nātọ madu utọ, Gi onye mara nma n'etiti ndinyom? Gini ka ihe-ya nātọ gi utọ bu kari onye ọzọ ihe-ya nātọ madu utọ, Na i b͕awo ayi iyi otú a? 10 Onye ihe-ya nātọm utọ di ọcha nācha kwa uhie uhie, Onye emeworo ka ọ di elu dika ọkọlọtọ kari orú nnù na nnù ise. 11 Isi-ya di ka ọla-edo ọma nke anuchara anucha, Agiri-isi-ya nēruda eruda dika igu nkwu, nēji nji dika ugolo-ọma. 12 Anya-ya abua di ka nduru n'akuku miri-iyi; Nāsa onwe-ha nime miri-ara-ehi, nānọdu n'akuku miri-iyi di iche iche juputara na miri. 13 Ǹtì-ya abua di ka nkpuru uda, dika ulo-elu nke nkpa-akwukwọ nēsì ísì utọ: Eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua di ka urodi, nābusi myrrh nērù erù. 14 Aka-ya abua di ka nb͕a-aka ọla-edo, nke ahiọgideworo beryl nime ha: Afọ-ya di ka ọdu nwupuru enwupu, nke ejiworo sapphire kpuchie ya. 15 Ogwe-ukwu-ya abua di ka ogidi marble, nke atọworo ntọ-ala-ha n'elu ukwu ọla-edo anuchara anucha: Iru-ya di ka Lebanon, mara nma nke-uku dika cedar. 16 Okpu-ọnu-ya tọkarisiri utọ: e, aru-ya nile bu ihe anāchọsi ike. Nka bu onye ihe-ya nātọm utọ, nka bu kwa eyìm, Unu umu-ndinyom Jerusalem.

Abù Nke Abù 6

1 Òle ebe onye ihe-ya nātọ gi utọ jeworo, Gi onye mara nma n'etiti ndinyom? Òle ebe onye ihe-ya nātọ gi utọ cheworo iru, Ka ayi we soro gi chọ ya? 2 Onye ihe-ya nātọm utọ aridaruwo ubi-ya ab͕ara ogige, rue nkpuru nile nke uda, Izù ìgwè aturu-ya n'ubi-ya nile ab͕ara ogige, na ichikọta urodi. 3 Mu onwem bu nke onye ihe-ya nātọm utọ, onye ihe-ya nātọm utọ bu kwa nkem: Bú onye ahu nke nāzù ìgwè aturu-ya n'etiti urodi. 4 Onye mara nma ka i bu, eyìm, dika Tiaza, I mara nma nke-uku dika Jerusalem, I bu onye anātu ujọ dika usu-ndi-agha chi ọkọlọtọ. 5 Wepu anya-gi abua n'irum, N'ihi na ha onwe-ha akpaliwom elu. Agiri-isi-gi di ka ìgwè ewu, Nke nēdina ala n'akuku ugwu Gilead. 6 Ezé-gi di ka ìgwè nne-aturu, Nke siworo n'isa-aru rigota; Nke ha nile chi umu abua umu abua, Ọ dighi kwa nke b͕a aka nwa n'etiti ha. 7 Dika iberibe pomegranate ka akuku egedege-iru-gi buN'azu ákwà-nkpuchi-gi. 8 Ọgu eze-nwanyi atọ di, ọgu ndinyom anọ, nke bu iko, di kwa, Na umu-ab͕ọghọ nādighi ọnu-ọgugu. 9 Nání otù ka ọ bu, bú ndurum, onye nkem nke zuru okè; Nání otù nwa nne-ya muru ka ọ bu; Onye arọputara arọputa nke nwanyi muru ya nwere ka ọ bu. Umu-ndinyom huru ya, we si na ọ bu onye ihe nāgara nke-ọma; E, ọgu eze-nwanyi atọ ahu na ọgu ndinyom anọ ahu, bú iko, ha we to ya. 10 Ònye bu nwanyi a nke nēlepu anya dika ututu, Nke mara nma dika ọnwa, Nēnwu ka anyanwu, Onye anātu ujo dika usu-ndi-agha chi ọkọlọtọ? 11 Rue ubi walnut ab͕ara ogige ka m'ridara, Ilekwasi akwukwọ ndu nke ndagwurugwu anya, Ihu ma osisi vine amawo ifuru, Na ihu ma osisi pomegranate ab͕awawo okoko. 12 Mb͕e m'kāmaghi, nkpuru-obim doromN'etiti ub͕ọ-ala nke ndim amara aha-ya. 13 Lata, lata, gi nwanyi Shulam; Lata, lata, ka ayi we lekwasi gi anya. Gini mere unu gēji lekwasi nwanyi Shulam anya, Dika ilekwasi otite-egwú nke Mahanaim?

Abù Nke Abù 7

1 Le ka nzọ-ukwu-gi nile si ma nma n'akpukpọ-ukwu sandal, gi nwa-nwanyi nke onye amara aha-ya! Apata-ukwu-gi abua nke di buruburu di ka ihe-ichọ-nma, Ọlu aka onye-ǹkà. 2 Otubo-gi di ka ọkwa di buruburu, Ka manya-vine agwara agwa ghara ikọ nime ya: Afọ-gi di ka obo ọka wheatNke eji urodi b͕a ya buruburu. 3 Ara-gi abua di ka umu-mb͕ada abuaNke bu umu abua nke otù nne-mb͕ada muru. 4 Olu-gi di ka ulo-elu nke ọdú; Anya-gi abua di ka ọdọ-miri nke di nime Heshbon, n'akuku ọnu-uzọ-ama Bat-rabim; Imi-gi di ka ulo-elu LebanonNke chere Damaskọs iru. 5 Isi-gi nke di n'elu gi di ka Kamel, Agiri-isi nke isi-gi di kwa ka ogho ododo; Ekeworo eze ab͕u na nruda-ya nile. 6 Le ka i si ma nma nke-uku, le kwa ka i si di utọ nke-uku, Gi ihu-n'anya, n'ihe-utọ nile! 7 Ogologo-gi nka yiri nkwu, Ara-gi abua yiri uyọkọ nkpuru-vine. 8 M'siri, M'gārigo elu nkwu, M'gējide igu-ya aka: Biko, ka ara-gi abua di kwa ka uyọkọ osisi vine, Ka ísì utọ nke imi-gi di kwa ka nkpuru-osisi apple; 9 Ka okpo-ọnu-gi di kwa ka manya-vine makarisiri nma, Nke nāsughari n'iko nke-ọma nye onye ihe-ya nātọm utọ, Nke nērùbà nwayọ n'eb͕ub͕ere-ọnu abua nke ndi nāraru ura. 10 Mu onwem bu nke onye ihe-ya nātọm utọ, N'arum ka ọchichọ-ya di kwa. 11 Bia, gi onye ihe-gi nātọm utọ, ka ayi pua ba n'ọhia; Ka ayi nọ ọnọdu-abali n'obodo ntà. 12 Ka ayi bilie n'isi-ututu je rue ubi-vine nile; Ka ayi hu ma osisi vine amawo ifuru, Ma okoko-ya ab͕awawo, Ma osisi pomegranate ab͕awawo okoko: N'ebe ahu ka m'gēnye gi ihu-n'anyam. 13 Mandrake nile nēsì ísì utọ, Ọzọ, n'elu ọnu-uzọ-ayi nile ka nkpuru-osisi nile di oké ọnu-ahia di, nke-ọhu na nke-ochie, Nke m'kpakọbaworo gi, onye ihe-gi nātọm utọ.

Abù Nke Abù 8

1 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na i dirim ka nwa-nnem nwoke, Nke miworo ara abua nke nnem! Mb͕e m'huru gi n'èzí, m'gēsutu gi ọnu; Ma ọ dighi onye gēledam anya. 2 M'gēduru gi, me ka i ba n'ulo nnem, I gēzím ihe; M'gēme ka i ṅua manya-vine ufọdu etiyere ihe-ísì-utọ, Ka i ṅu kwa manya pomegranate nkem ufọdu. 3 Aka-ekpe-ya gādi n'okpuru isim, Aka-nri-ya gāb͕akum. 4 Unu umu-ndinyom Jerusalem, ab͕am unu iyi, Gini mere unu ji akpọte ihu-n'anya? ma-ọbu gini mere unu ji eme ka ọ teta? Rue mb͕e ọ gātọ ya utọ. 5 Ònye bu nwayi a nke nēsi n'ọzara arigota, Dabere n'aru onye ihe-ya nātọ ya utọ? N'okpuru osisi apple ka m'kpọtere gi: N'ebe ahu ka ime gi nēme nne-gi, N'ebe ahu ka ime nēme ya, o we muputa gi. 6 Tukwasim dika nb͕a-aka-akàrà n'obi-gi dika nb͕a-aka-akàrà n'ogwe-aka-gi: N'ihi na ihu-n'anya di ike dika ọnwu; Ekworo siri ike dika ala-mọ: Nnwupu-ya nile bu nnwupu nke ọku, Ire-ọku nke Ja onwe-ya. 7 Ọtutu miri apughi imenyu ihu-n'anya, Osimiri nile agaghi-erikpu kwa ya: Ọ buru na onye ọ bula gēnye àkù nile nke ulo-ya n'ihi ihu-n'anya, Agēleda ya anya nke-uku. 8 Ayi nwere otù nwa-nne nwayi di ntà, Ma ọ dighi ara ọ kpuru: Gini ka ayi gēmere nwa-nne-ayiN'ubọchi mb͕e agēkwu okwu-ya? 9 Ọ buru na ọ bu mb͕idi, Ayi gēwukwasi ya ulo-elu nke ọla-ọcha: Ma ọ buru na ọ bu ọnu-uzọ, Ayi gēji ibo cedar mechibido ya. 10 Mu onwem bu mb͕idi, aram abua di kwa ka ulo-elu-ya: Mb͕e ahu adim n'anya-ya dika onye nāchọta udo. 11 Solomon nwere ubi-vine nime Beal-hamon; Ọ nyere ubi-vine ahu n'aka ndi-nche; Onye ọ bula n'ọnọdu nkpuru-ya gēweta nnù ego ọla-ọcha abua na ọgu iri. 12 Ubi-vine nkem, nke m'nwere, di n'irum: Nnù abua na ọgu iri ahu gādiri gi, Solomon, Ọgu iri gādi-kwa-ra ndi nēche nkpuru-ya. 13 Gi onye bi n'ubi ab͕ara ogige, Ndi ejikọtara gi na ha nāṅa nti olu-gi: Mem ka m'nuru ya. 14 B͕alaga, gi onye ihe-gi nātọm utọ, Yi kwa mb͕ada ma-ọbu nwa-eleN'elu ugwu nile nke uda di iche iche.

Aisaia 1

1 Ọhù Aisaia nwa Emoz, nke ọ huru bayere Juda na Jerusalem n'ubọchi Uzaia na Jotam na Ehaz na Hezekaia, bú ndi-eze Juda. 2 Nurunu, elu-igwe, gi uwa, ṅa kwa nti, n'ihi na Jehova ekwuwo okwu: umu ka M'meworo ka ha toputa, emewokwam ka ha di elu, ma umu ahu ejehiewo megidem. 3 Ehi mara onye-nwe-ya, inyinya-ibu ma-kwa-ra ebe-ọzùzù-anu nke onye-nwe-ya: ma Israel amaghi, ndim atukwasighi uche. 4 Ahuhu gādiri mba nmehie, ndi ajọ omume nānyib͕u, nkpuru nke bu ndi nēme ihe ọjọ, umu nke nēbibi onwe-ha: ha arapuwo Jehova, ha elelìwo Onye Nsọ nke Israel, ha aghọwo ndi ala ọzọ, laghachi azu. 5 N'ìhi gini ka aganēti unu ihe rue ub͕u a, na unu nēwezuga onwe-unu kari? isi nile ọ bula nāria ọria, aru adighi kwa obi nile ọ bula ike. 6 Site n'ọbu-ukwu we rue isi ọ dighi izu-okè di nime ya; kama ob͕ub͕u-mma, na itiru-aru, na ọnyá etiputara ọhu: apikọtaghi ha, ekechighi kwa ha, ejighi kwa manu me ka ha di nrò. 7 Ala-unu bu ebe tọb͕ọrọ n'efu; obodo-unu, esurewo ha n'ọku; ala-ubi-unu, n'iru unu ka ndi ala ọzọ nēri ya, ọ bu kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu, dika nkwatu ndi ala ọzọ. 8 Ma ada Zaion fọduru dika ulo-ntu n'ubi-vine, dika ulo-ọnọdu-abali n'ubi cucumbei, dika obodo nke ndi-iro-ya nēche nche. 9 Ọ buru na Jehova nke usu nile nke ndi-agha emeghi madu ole-na-ole nke fọduru ka ha fọduru ayi, ayi gādiwori ka Sọdọm, ayi gēyiwori Gọmọra. 10 Nurunu okwu Jehova, unu ndi-ikpe Sọdọm; ṅanu nti n'iwu Chineke-ayi, unu ndi Gọmọra. 11 Jehova nāsi, N'ìhi gini ka unu nāchurum ọtutu àjà-unu? afọ ejuwom n'àjà-nsure-ọku nile eji ebulu chu, na abuba umu-ehi emere ka ha ma abuba; ọzọ, ọbara oke-ehi na nke umu-aturu na nke nkpi atọghm utọ. 12 Mb͕e unu nābia ka ahu unu n'irum, ònye chọworo nka n'aka-unu, ka unu zọtọ ogigem nile? 13 Unu ebubata-kwa-la onyinye-inata-iru-ọma ọzọ nke bu ihe-efu; ihe-nsure-ọku nke nēsì ísi utọ, ihe-árú ka ọ burum; ọnwa ọhu na ubọchi-izu-ike, ikpọ nkpọkọta -- apughm inagide ajọ omume na ubọchi nb͕ochi. 14 Ọnwa ọhu nile unu na mb͕e nile unu akara àkà, nkpuru-obim akpọwo ha asì: ha aghọwo ibu di arọ̀ n'arum, ike ibūru ha agwuwom. 15 Ọzọ, mb͕e unu nāb͕asa ọbu-aka-unu abua, M'gēzonari unu anyam abua: ọbuná mb͕e unu nēkpe ọtutu ekpere, M'gaghi-adi nānu: aka-unu juputara n'ọbara. 16 Sanu aru, menu onwe-unu ka unu di ọcha; wezuganu ihe ọjọ nke omume-unu nile n'iru anyam abua; rapunu ime ihe ọjọ: 17 mutanu ime ezi ihe; chọnu ikpé ziri ezi, menu ka onye nēme ihe-ike gazi agazi, kpenu nwa-nb͕ei ikpe ziri ezi, kpenu ọnu nwayi di-ya nwuru. 18 Biko bianu, ka ayi rurita uka, bú ihe Jehova nāsi: ọ buru na nmehie-unu adi ka uwe uhie, ọ bu dika snow ka ha gādi ọcha; ọ buru na ha acha uhie uhie dika ogho uhie, ọ bu dika aji ọcha ka ha gādi. 19 Ọ buru na unu ekwe, we nu, ezi ihe nke ala-unu ka unu gēri: 20 ma ọ buru na unu aju, we nupu isi, mma-agha gērichapu unu: n'ihi na ọnu Jehova ekwuwo. 21 Ò si-kwa-ra aṅa ghọ nwanyi nākwa iko, bú obodo ahu kwesiri ntukwasi-obi? obodo ahu nke juputara n'ikpé ziri ezi! ezi omume nānọri ọnọdu-abali nime ya, ma ub͕u a ndi-ob͕u-madu. 22 Ọla-ọcha-gi aghọwo afuru-uzu; ihe-ọṅuṅu ọma gi, agwawo ya miri nke-uku. 23 Ndi-isi-gi nēwezuga onwe-ha n'ebe M'nọ, ha bu kwa ndi ejikọtara ha na ndi-ori; onye ọ bula nime ha nāhu iri-ngo n'anya, nāb͕aso kwa ihe-nkwughachi: ọ dighi nwa-nb͕ei ha nēkpe ikpe ziri ezi, okwu-ikpe nke nwanyi di-ya nwuru adighi-abiakute kwa ha. 24 N'ihi nka, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Onye di ike nke Israel, puta, ) A, M'ga-akasi Onwem obi site na ndi nēmegidem, M'gābọ-kwa-ra Onwem ọ́bọ̀ n'aru ndi-irom: 25 M'gēme kwa ka akam biaghachi n'aru gi, M'gānuchapu kwa afuru-uzu-gi, dika eji akanwu me, M'gēwezuga kwa ihe nile gwara agwa nime gi: 26 M'gēme kwa ka ndi-ikpe-gi laghachi dika na mbu, M'gēme kwa ka ndi nādu gi ọdu laghachi dika na nmalite: emesia agākpọ gi Obodo ezi omume, obodo nke kwesiri ntukwasi-obi. 27 Agēji ikpé b͕aputa Zaion, agēji kwa ezi omume b͕aputa ndi-ya nālata. 28 Ma ntipia nke ndi nēmebi iwu na ndi-nmehie gādi n'otù, agēme kwa ka ndi nārapu Jehova gwusia. 29 N'ihi na ha gēme ihere osisi terebinth nile nke unu chọsiworo ike, unu gēnwe kwa iru-ihere site n'ubi nile ab͕ara ogige nke unu rọputaworo. 30 N'ihi na unu gādi ka osisi terebinth nke akwukwọ-ya nākpọnwu akpọnwu, na dika ubi ab͕ara ogige nke nēnweghi miri. 31 Ọgaranya gāghọ kwa eriri-nzuzu, ọlu-ya gāghọ kwa icheke-ọku; ha abua gēre kwa ọku n'otù, ọ dighi kwa onye nēmenyu ha.

Aisaia 2

1 Okwu nke Aisaia nwa Emoz huru bayere Juda na Jerusalem. 2 O gēru kwa n'ikpe-azu nke ubọchi ndia, na ugwu nke ulo Jehova ganēguzosi ike n'elu ugwu nile, agēbuli kwa ya elu kari ugwu ntà nile; mba nile gērùbà nime ya dika osimiri. 3 Ọtutu ndi di iche iche gēje kwa, si, Bianu, ka ayi rigorue ugwu Jehova, rue ulo Chineke nke Jekob; O gēzí kwa ayi uzọ-Ya ufọdu, ayi gēje kwa ije n'okporo-uzọ-Ya nile: n'ihi na Zaion ka iwu gēsi puta, okwu Jehova gēsi kwa na Jerusalem puta. 4 Ọ gēkpe kwa ikpe n'etiti mba nile, dozi-kwa-ra ọtutu ndi di iche iche okwu-ha: ha gākpughari kwa mma-agha-ha nile ka ha buru mma-ọgè, na ube-ha nile ka ha buru mma-ikwa-osisi: mba agaghi-ebuli mma-agha megide mba, ha agaghi-amuta kwa agha ọzọ. 5 Ulo Jekob, bianu, ka ayi jegharia n'ìhè Jehova. 6 N'ihi na I rapuwo ndi-Gi, bú ulo Jekob, n'ihi na ha juputara n'ome-n'ala site n'Iru-anyanwu, ha bu kwa ndi ji igwe-oji atù isi ọma na isi ọjọ dika ndi Filistia, ọzọ, ha na umu ndi ala ọzọ nēkwekọ aka. 7 Ala-ha juputa-kwa-ra n'ọla-ọcha na ọla-edo, ọ dighi kwa ọgwugwu diri àkù-ha; ala-ha juputa-kwa-ra n'inyinya, ọ dighi kwa ọgwugwu diri ub͕ọ-ala-ha. 8 Ala-ha juputa-kwa-ra n'ihe-efu; ọlu nke aka-ha ka ha nākpọ isi ala nye, bú ihe nke nkpisi-aka-ha mere. 9 Madu we ruda n'ala, onye di elu nēme kwa onwe-ya ka ọ di ala: ebupu-kwa-la nmehie-ha. 10 Ba n'oké nkume, zobe kwa onwe-gi n'ájá, ipu n'iru oké egwu Jehova, na ipu n'ima-nma nke idi-elu-Ya. 11 Aghaghi ime anya npako nke madu ka ha di ala, aghaghi kwa iruda nbuli-elu nke ndi nile n'ala, aghaghi kwa ime ka Jehova, nání Ya, di elu n'ubọchi ahu. 12 N'ihi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha nwere otù ubọchi nke gādakwasi ihe ọ bula di npako nke di kwa elu, ọ gādakwasi kwa ihe ọ bula ebuliworo elu; ewe me ya ka ọ di ala: 13 ọ gādakwasi kwa osisi cedar nile nke Lebanon nke di elu nke ebuliwo-kwa-ra ha elu, ọ gādakwasi kwa osisi oak nile nke Beshan; 14 ọ gādakwasi kwa ugwu nile nke di elu, ọ gādakwasi kwa ugwu ntà nile nke ebuliworo elu; 15 ọ gādakwasi kwa ulo-elu ọ bula di elu, ọ gādakwasi kwa mb͕idi ọ bula ewusiri ike; 16 ọ gādakwasi kwa ub͕ọ nile nke Tashish, ọ gādakwasi kwa ihe-ile-anya nile anāchọsi ike. 17 Aghaghi kwa iruda npako madu, aghaghi kwa ime nbuli-elu nke ndi nile ka ọ di ala: aghaghi kwa ime ka Jehova, nání Ya, di elu n'ubọchi ahu. 18 Ma ihe-efu-ha, ha nile aghaghi igasi. 19 Madu gābà kwa n'ọb͕à nile nke oké nkume nile, na n'olùlù nile nke ájá, ipu n'iru oké egwu Jehova, na ipu n'ima-nma nke nbili-elu-Ya, mb͕e O biliri ime ka uwa ma jijiji nke-uku. 20 N'ubọchi ahu madu gētufu ihe-efu-ya nile nke ọla-ọcha, na ihe-efu-ya nile nke ọla-edo, nke ha mere ka ọ we kpọ isi ala nye ha, ọ gētufu ha nye anu mole na usu; 21 ka o we ba n'oghere nile nke oké nkume nile, na nime nb͕awa nile nke nkume nile di elu, ipu n'iru oké egwu Jehova, na ipu n'ima-nma nke nbili-elu-Ya, mb͕e O biliri ime ka uwa ma jijiji nke-uku. 22 Rapunu madu, onye otù nku-ume di n'imi-ya: n'ihi na nìme gini ka aganāgu ya?

Aisaia 3

1 N'ihi na, le, Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nēsi na Jerusalem, si kwa na Juda, wezuga ihe-ndabere na nkpa-n'aka, ihe-ndabere nile, bú nri, na ihe-ndabere nile, bú miri; 2 dike, na onye-agha; na onye-ikpe, na onye-amuma, na onye nāju ase, na okenye; 3 onye-isi nke ọgu ndi-agha abua na iri, na onye anāhu iru-ọma, na onye-ndum-ọdu, na onye mara ihe n'etiti ndi-ọ̀kà, na onye-nghọta n'irà urà. 4 M'gēwere kwa umu-okoro nye ka ha buru ndi-isi-ha, umu nāṅu ara gāchi kwa ha. 5 Ndi ahu gāchirita onwe-ha n'ihe-ike, otù onye megide onye ọzọ, na otù onye megide ibe-ya: ha gēbulite onwe-ha, nwa-okoro megide okenye, na onye anēlilì megide onye anāsọpuru. 6 Mb͕e otù onye gējide nwa-nne-ya n'ulo nna-ya, si, I nwere uwe-nb͕okwasi, onye-ikpe ka i gāburu ayi, ka ihe-isu-ngọngọ a di kwa n'okpuru aka-gi: 7 ọ gēweli olu-ya n'ubọchi ahu, si, M'gaghi-abu onye-nkechi; n'ihi na ọ dighi nri di n'ulom, ọ dighi kwa uwe-nb͕okwasi: unu agaghi-edom onye-ikpe ndi-ayi. 8 N'ihi na Jerusalem asuwo ngọngọ, Juda adawo kwa: n'ihi na ire-ha na omume-ha nile nēmegide Jehova, inupu isi n'okpuru anya abua nke ebube-Ya. 9 Nmata ha nāmata iru madu n'ikpe azawo megide ha; nmehie-ha ka ha gosiwo-kwa-ra dika Sọdọm, ha ezobeghi ya. Ahuhu gādiri nkpuru-obi-ha! n'ihi na ha emesowo onwe-ha ihe ọjọ. 10 Sinu onye ezi omume, na ọ gādiri ya nma: n'ihi na nkpuru omume-ha nile ka ha gēri. 11 Ahuhu gādiri onye nēmebi iwu! ọ gādiri ya njọ: n'ihi na nmeso aka-ya abua mesoro madu ka agēme ya. 12 Ndim, ndi nāchi ha n'ihe-ike bu nwatakiri, ndinyom achiwo kwa ha. Gi ndim, ndi-nduzi-gi nēme ka i wagharia, ha elodawo kwa uzọ nke okporo-uzọ-gi nile. 13 Jehova nēguzo Onwe-ya ikpe ọnu-Ya, Ọ nēguzo kwa ikpe ndi nile di iche iche. 14 Jehova gēso ndi-okenye nke ndi-Ya na ndi-isi-ha ba n'ikpé, si, Ma unu onwe-unu, unu eripiawo ubi-vine; ihe unu napuworo onye ewedara n'ala n'ike di n'ulo-unu nile: 15 gini mere unu ji azọpia ndim, gwepia kwa iru onye ewedara n'ala? ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, puta. 16 Jehova we si, N'ihi na umu-ndinyom Zaion di npako, nēwere kwa olu setiri eseti na anya nāràrá ndikom ejeghari, nārọ nma mb͕e ha nējeghari, nēwere kwa ukwu-ha eme ka ọla-ukwu-ha da udà: 17 n'ihi nka Onye-nwe-ayi gēme kwa ka ọnyá di n'opu-n'isi umu-ndinyom Zaion, Jehova ga-agbaba kwa ha ọtọ. 18 N'ubọchi ahu Onye-nwe-ayi gēwezuga ima-nma nke ọla-ukwu-ha nile, na ihe-ichọ-nma nile ha nēyi n'egedege-iru, na ihe-ichọ-nma nile nke yiri ọnwa ọhu; 19 na ihe nile anākwuba na nti, na ọla-aka nile, na ákwà nb͕ochi-iru nile; 20 na ihe ọma nile ike n'isi, na iyab͕a-ukwu nile, na ihe nile ike n'úkwù, na karama ihe ísì ọma nile, na ọgwù di iche iche iyi n'aru; 21 na nb͕a-aka-akàrà nile, na nb͕a-aka imi nile; 22 na uwe ememe nile, na uwe-nwuda nile, na ákwà-nb͕okwasi nile, na akpa nile; 23 na enyo-aka nile, na ezi ákwà ọcha nile, na ákwà ọma nile ikuku n'isi, na ákwà-nb͕ochi nile. 24 Ọ gēru kwa, na n'ọnọdu uda ọma ire-ure gādi; n'ọnọdu ihe ike n'úkwù udọ̀ gādi; n'ọnọdu agiri-isi akpara nke-ọma nkwọcha-isi gādi; n'ọnọdu ákwà ọma ihe-ọkiké nke ákwà-nkpe gādi: eb͕ub͕u-ọku gādi n'ọnọdu ima-nma. 25 Ndikom-i gāda site na mma-agha, idi-ike-gi nile gāda kwa n'agha. 26 Ọnu-uzọ-ya nile gēze ume, ru kwa újú; agēme kwa ka ọ tọb͕ọrọ n'efu, ọ gānọdu n'ala.

Aisaia 4

1 Ọzọ, ndinyom asa gējide otù nwoke n'ubọchi ahu, si Nri nke aka ayi ka ayi gēri, uwe nke aka ayi ka ayi gēyi kwa: ọ bu nání na agākpọkwasi ayi aha-gi; gi wepu ita-uta-ayi. 2 N'ubọchi ahu ka ihe-opupú nke Jehova gāghọ ihe mara nma na ihe-nsọpuru, nkpuru nke ala gāghọ-kwa-ra ndi Israel b͕apuru ab͕apu nbili-elu na ima-nma. 3 O gēru kwa, na onye emeworo ka ọ fọdu na Zaion, na onye fọduru na Jeruzalem, onye nsọ ka agākpọ ya, bú onye ọ bula nke edeworo ya n'akwukwọ idi ndu nime Jerusalem: 4 mb͕e Onye-nwe-ayi gāsachapuwori inyi umu-ndinyom Zaion, ṅachapu kwa ọbara Jerusalem n'etiti ya, site na Mọ nke ikpé, na site na Mọ nke nkpochapu. 5 Jehova gēkè kwa n'elu ebe ahu nile guzosiri ike nke ugwu Zaion, na n'elu nkpọkọta-ya nile, igwe-oji na anwuru-ọku n'ehihie, na onwunwu nke ọku nēre ere n'abali: n'ihi na n'elu ebube nile ka agāb͕asa ihe-nkpuchi. 6 Ulo-ntu gādi kwa ibu ǹdò n'ehihie ipu n'okpom-ọku, na ibu ebe-nb͕abà, na ibu ebe-nzuzo ipu n'oké miri-ozuzo na ipu na miri-ozuzo nile.

Aisaia 5

1 Biko, ka m'bùara onye ihe-ya nātọm utọ nke-uku abù nke onye ihe-ya nātọm utọ bayere ubi-vine-ya. Onye ihe-ya nātọm utọ nke-uku nwere ubi-vine n'ugwu ntà nke bu ezi oké ala: 2 o we gwue ya, tutupu nkume-ya nile, kua osisi vine kachasi nma nime ya, wue ulo-elu n'etiti ya, waputa kwa ebe-inara-manya-vine nime ya: o we le anya na ọ gāmi nkpuru-vine, ma ọ miri nkpuru-vine ọhia. 3 Ma ub͕u a, unu ndi bi na Jerusalem na ndi Juda, biko, kpenu ikpe n'etiti mu na ubi-vine nkem. 4 Gini ka agēme ubi-vine nkem ọzọ, nke m'nēmeghi nime ya? gini mere, mb͕e m'lere anya na ọ gāmi nkpuru-vine, o ji mia nkpuru-vine ọhia? 5 Ma ub͕u a, biko, ka m'me ka unu mara ihe mu onwem gaje ime ubi-vine nkem: m'gēwezuga ogige-ya, o we ghọ ebe anu-ulo nāta nri; m'gētipia mb͕idi-ya, o we ghọ ebe anāzọtọ: 6 m'gēme kwa ka ọ gwusia; agaghi-akwacha vine-ya, agaghi-edozi kwa ya; ma ogwu na uke gētoputa: igwe-oji nile ka m'gēnye kwa iwu ka ha ghara izokwasi ya miri. 7 N'ihi na ubi-vine nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu ulo Israel, ndi Juda bu kwa ihe-ọkukú nātọ Ya utọ nke-uku: O we le anya ikpe ziri ezi, ma, le, nwusi-ọbara; O lere anya ezi omume, ma, le, iti-nkpu. 8 Ahuhu gādiri ndi nātukwasi ulo n'ulo, ndi nēme ka ubi rue ubi nso, rue mb͕e ọnọdu adighi kwa ọzọ, ewe me ka nání unu biri n'etiti ala! 9 Na ntim abua ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha kwuru, si, N'ezie ọtutu ulo gāghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ọbuná ulo uku nke bu kwa ezi ulo, nke ọ nādighi onye ọ bula nēbi nime ha. 10 N'ihi na ala ubi-vine nke madu gēji ehi abua alu n'ubọchi iri gēweputa nání otù ihe-ọtùtù bath nke manya-vine, ọzọ, otù ihe-ọtùtù homer nke nkpuru-ọghigha gāmi nání otù ihe-ọtùtù ephah. 11 Ahuhu gādiri ndi nēbili n'isi-ututu ib͕aso ihe-ọṅuṅu nābà n'anya; ndi nānọ ogologo mb͕e n'anyasi, manya-vine ewe me ka aru nwuru ha ọku. 12 Ubọ-akwara na une na egwú-otiti na ọ̀jà na manya-vine di kwa n'ọṅuṅu-manya-vine-ha nile: ma ha adighi-elegide ọlu Jehova anya, ha ahughi kwa ihe aka-Ya abua nēme. 13 N'ihi nka ndim ejewo biri n'ala ọzọ, site n'amaghi-ama: ndi-nsọpuru-ha bu kwa ndi agu nāgub͕u, ìgwè-ha bu kwa ndi akpiri miri nākpọsi nku ike. 14 N'ihi nka ala-mọ emewo ka ọchichọ-nkpuru-obi-ya sa mbara, ọ saghebigawo kwa ọnu-ya ókè: ima-nma Jerusalem, na ìgwè-ya, na nkpọtu-ya, na onye nāṅuri ọṅu-agha n'etiti ya, gārida kwa nime ya. 15 Onye di ala we ruda n'ala, onye di elu nēme kwa onwe-ya ka ọ di ala, anēme kwa anya abua nke ndi di elu ka ha di ala: 16 ma Jehova nke usu nile nke ndi-agha di elu n'ikpé, edowo kwa Chineke, bú Onye Nsọ ahu, nsọ n'ezi omume. 17 Umu-aturu gāta kwa nri dika ọ bu n'ọzara-ha, ndi-ọbìa gērichapu kwa nkpọnkpọ-ebe nile nke ndi ahu mara abuba. 18 Ahuhu gādiri ndi chiri udọ̀ ihe-efu adọkpu ajọ omume, ndi ji kwa dika agāsi na ọ bu udọ̀ ub͕ọ-ala adọkpu nmehie: 19 ndi nāsi; Ya me ngwa, Ya lua ọlu-Ya ọsọsọ, ka ayi we hu: ka ndum-ọdu nke Onye Nsọ nke Israel bia rue ayi nso bia, ka ayi we mara. 20 Ahuhu gādiri ndi nākpọ ihe ọjọ ezi ihe, ndi nākpọ kwa ezi ihe ihe ọjọ; ndi nētiye ọchichiri n'ọnọdu ìhè, na ìhè n'ọnọdu ọchichiri; ndi nētiye ihe ilu n'ọnọdu ihe utọ, na ihe utọ n'ọnọdu ihe ilu! 21 Ahuhu gādiri ndi mara ihe n'anya ha onwe-ha, ndi nēle kwa onwe-ha anya na ha bu ndi-nghọta! 22 Ahuhu gādiri ndi-dike n'iṅu manya-vine, ndi bu kwa dìnkpà n'itigwa ihe-ọṅuṅu n'anya: 23 ndi nāgu onye nēmebi iwu n'onye ezi omume n'ihi iri-ngo, ha nēwezuga kwa ezi omume nke onye ezi omume n'aru ya! 24 N'ihi nka dika ire ọku si erichapu ahihia-ọka, na dika ahihia nke kpọrọ nku si ada n'ọku nēnwu enwu, otú a nkpọrọgwu-ha gādi ka ihe nēre ure, ifuru-ha gāla kwa elu dika uzuzu: n'ihi na ha ajuwo iwu nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha, ọ bu kwa okwu-ọnu nke Onye Nsọ nke Israel ka ha lelìworo. 25 N'ihi nka ka iwe Jehova di ọku n'aru ndi-Ya, O we setipu aka-Ya megide ha, tib͕ue ha, ugwu nile we ma jijiji, ozu ndi ahu we di ka ǹsí-anu n'etiti èzí nile. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti. 26 O we weliere mba ndi sitere n'ebe di anya ọkọlọtọ, kpọkọta ya òkù site na nsọtu uwa: ma, le, ọ nēme ngwa bia ọsọsọ: 27 ọ dighi onye nāda #mbà, ọ dighi kwa onye nāsu ngọngọ, n'etiti mba ahu; ọ dighi onye nātu òrù-ura, ọ dighi kwa onye nāraru ura; agaghi-atọpu kwa ihe-ọkiké úkwù-ha, agaghi-etibi kwa eriri akpukpọ-ukwu-ha abua: 28 ndi àkú-ha nile di nkọ, uta-ha nile ka azọrọ ukwu ikwe ha; aguwo ukwu inyinya-ha nile dika ọmu, na wheel-ha nile dika oké ifufe: 29 uja ha nāb͕ọ di ka nke nne-ọdum, ha nāb͕ọ uja dika umu-ọdum; e, ha nēbib͕ọ, jide anu-ndọb͕u, buru ya la, ma onye-nnaputa adighi. 30 Ha gēbib͕ọ kwa megide ya n'ubọchi ahu dika nbib͕ọ nke oké osimiri: asi kwa na madu elegide ala anya, le, ọchichiri di; nkpà na ìhè; ọ b͕awo ọchichiri n'igwe-oji-ya nile.

Aisaia 6

1 N'arọ nke ọnwu eze, bú Uzaia, m'we hu Onye-nwe-ayi ka Ọ nānọkwasi n'oche-eze di elu nke ebuliwo-kwa-ra elu, ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-Ya juputa-kwa-ra ulo uku Chineke. 2 Ndi-seraph nēguzo n'elu ya: nkù isi nkù isi ka seraph ọ bula nime ha nwere; abua ka o ji ekpuchi iru-ya, abua ka o ji ekpuchi ukwu-ya abua, abua ka o ji efe efe. 3 Otù we kpọ ibe-ya òkù, si, Nsọ, nsọ, nsọ, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha di: ùjú uwa nile bu ebube-Ya. 4 Ntọ-ala nile nke nbata-uzọ nile we me nkpatu site n'olu onye ahu nke nākpọ òkù, ulo we juputa n'anwuru-ọku. 5 M'we si, Ahuhu nādirim, n'ihi na alawom n'iyì; n'ihi na onye eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ruru árú ka m'bu, ọ bu kwa n'etiti ndi eb͕ub͕ere-ọnu-ha ruru árú ka m'nēbi: n'ihi na ọ bu Eze-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, ka anyam abua huworo. 6 Otù nime ndi-seraph we fekutem, jide otù nkume di ọku n'aka-ya, nke o ji nkpa weputa n'elu ebe-ichu-àjà: 7 o we were ya metu ọnum, si, Le, nka emetuwo eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua; ewe wezuga ajọ omume-gi, kpuchi kwa nmehie-gi. 8 M'we nu olu Onye-nwe-ayi, ka ọ nāsi, Ònye ka M'gēziga, ònye gēje-kwa-ra ayi? M'we si, Lem; zigam. 9 O we si, Je, si ndi nka, Nānunu, ma unu aghọtala; nāhunu, ma unu amatala. 10 Me ka obi ndi nka ma abuba, me kwa ka nti-ha di arọ́, techi kwa anya-ha; ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ, ghara kwa iwere nti-ha nu ihe, ghara kwa iwere obi-ha ghọta, ghara kwa ichighari, ka aghara kwa ime ka aru di ha ike. 11 M'we si, Rùe ole mb͕e, Onye-nwe-ayi? O we si, Rue mb͕e obodo nile tọb͕ọrọ n'efu nēnweghi onye-obibi, ulo nile kwa, nēnweghi madu; rue mb͕e emeworo ka ala ndi ahu tọb͕ọrọ n'efu, ọbuná ebe tọb͕ọrọ n'efu, 12 rue mb͕e Jehova meworo ka madu je n'ebe di anya, o we rie nne, bú ebe arapuru arapu n'etiti ala ahu. 13 Ma ọ buru na otù uzọ n'uzọ iri afọdu nime ya, aghaghi irechapu kwa ya ọzọ: dika osisi terebinth, na dika osisi oak, nke ogwe fọduru ha mb͕e eb͕utusiri ha; nkpuru nsọ bu ogwe-ya.

Aisaia 7

1 O rue, n'ubọchi Ehaz nwa Jotam, nwa Uzaia, bú eze Juda, na Rezin, bú eze Siria, rigoro, ya na Peka nwa Remalaia, bú eze Israel, rue Jerusalem, ibu agha megide ya; ma ọ pughi ibu agha megide ya. 2 Ewe gosi ulo Devid, si, Siria nēzu ike n'elu Efraim. Obi-ya na obi ndi-ya we me nkpatu, dika osisi nile nke oké ọhia si eme nkpatu n'iru ifufe. 3 Jehova we si Aisaia, Biko, pua izute Ehaz, gi onwe-gi, na Shea-jashub nwa-gi, rue nsọtu uzọ-miri nke ọdọ-miri di n'elu, rue uzọ atuliri atuli nke ọhia ọsu-ákwà; 4 si ya, Lezie anya, nọ kwa jū; atula egwu, ka obi-gi ghara kwa itu ujọ, site n'ọdudù abua ndia nke ọlọkọ-ọku nākwu anwuru-ọku, n'ihi iwe di ọku nke Rezin na Siria, na nke nwa Remalaia. 5 N'ihi na Siria aduwo ọdu imegide gi ihe ọjọ, Efraim kwa, na nwa Remalaia, si, 6 Ka ayi rigo imegide Juda, ka ayi me kwa ka ike gwusia ya, ka ayi wapuere onwe-ayi ya, me ka otù onye buru eze n'etiti ya, bú nwa Tabeel. 7 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri, Ọ gaghi-eguzosi ike, ọ gaghi-adi kwa. 8 N'ihi na isi Siria bu Damaskọs, isi Damaskọs bu kwa Rezin: ma tutu ọgu arọ atọ na ise eruzue agētipia Efraim, ka ọ ghara ibu otù ndi: 9 ọzọ, isi Efraim bu Sameria, isi Sameria bu kwa nwa Remalaia. Ọ buru na unu adighi-ekwe, n'ezie unu agaghi-ekwesi ntukwasi-obi. 10 Jehova we gwa kwa Ehaz okwu ọzọ, si, 11 Riọrọ onwe-gi ihe-iriba-ama n'aka Jehova, bú Chineke-gi; riọ ya n'ebe miri emi, ma-ọbu n'ebe di elu nke di n'elu. 12 Ehaz we si, M'gaghi-ariọ, m'gaghi-anwa kwa Jehova. 13 O we si, Biko, nurunu, ulo Devid; ọ̀ bu ihe ntà na unu nēme ka ike gwu madu, na unu gēme kwa ka ike gwu Chinekem? 14 N'ihi nka Onye-nwe-ayi onwe-ya gēnye unu ihe-iriba-ama; le, nwa-ab͕ọghọ ahu di ime, ọ gaje kwa imu nwa-nwoke, ọ gākpọ kwa aha-ya Immanuel. 15 Miri-ara-ehi raruru araru na manu-aṅu ka nwa-okoro ahu gēri, mb͕e ọ mara iju ihe ọjọ na irọputa ezi ihe. 16 N'ihi na tutu nwa-okoro ahu amara iju ihe ọjọ na irọputa ezi ihe, agārapu ala ahu nke ike eze-ha abua gwuworo gi onwe-gi. 17 Jehova gēme ka ubọchi biakwasi n'aru gi na n'aru ndi-gi, na n'aru ulo nna-gi, bú ubọchi nke nābiaghi site n'ubọchi Efraim wezugara onwe-ya n'aru Juda; ọbuná eze Asiria. 18 O gēru kwa, n'ubọchi ahu, na Jehova gākpọkọta ijiji nke di na nsọtu osimiri Nail nile nke Ijipt òkù, kpọ kwa aṅu nke di n'ala Asiria. 19 Ha gābia kwa, ha nile gēbekwasi kwa na ndagwurugwu nile nke ebe di nkputankpu, na nime nb͕awa nile nke nkume nile di elu, na n'ogwu nile, na n'ọzara nile. 20 N'ubọchi ahu Onye-nwe-ayi gēji aguba nke egotara egota n'ofè nile nke Osimiri, bú eze Asiria, kọpu isi na aji ukwu: ọbuná afu-ọnu ka ọ gākọchapu kwa. 21 O geru kwa, n'ubọchi ahu, na otù onye gēdebe otù nwa-ab͕ọghọ-ehi nke ìgwè ehi-ya, na nne-aturu abua nke ìgwè ewu na aturu-ya ndu; 22 ọ gēru kwa, site n'ọtutu miri-ara ha gāb͕a, na ọ gēri miri-ara raruru araru: n'ihi na miri-ara raruru araru na manu-aṅu ka onye ọ bula nke fọduru n'etiti ala nka gēri. 23 O gēru kwa, n'ubọchi ahu, na ebe ọ bula, nke nnù vine abua na ọgu iri di ya, nke ọnu-ahia-ha bu nnù ego ọla-ọcha abua na ọgu iri, ọ gādiri ogwu, di-kwa-ra uke. 24 Agāchiri àkú, were kwa uta, bia n'ebe ahu; n'ihi na nání ogwu na uke ka ala nka nile gābu. 25 Ma ugwu nile nke anējiri ọ́gù bọ, i gaghi-abà n'ebe ahu n'ihi egwu ogwu na uke, kama ọ gābu ebe anēziga ehi, na ebe aturu nāzọ ukwu.

Aisaia 8

1 Jehova we sim, Were n'onwe-gi otù oké mbadamba ihe, ji kwa ihe madu ji ede ihe-odide dekwasi ya, Nka diri Maha-shalal-hash-baz; 2 M'gēme kwa ka ndi-àmà nke kwesiri ntukwasi-obi nọrọm n'àmà, bú Uraia onye-nchu-àjà, na Zekaraia nwa Jeberekaia. 3 M'we bakuru nwunyem, bú amuma-nwanyi; o we turu ime, mua nwa-nwoke. Jehova we sim, Kpọ aha-ya Maha-shalal-hash-baz. 4 N'ihi na tutu nwata ahu amara ikpọ, si, Nnam, na, Nnem, agēbulaga àkù Damaskọs na ihe Sameria akwatara n'agha n'iru eze Asiria. 5 Jehova we gwakwam okwu ọzọ, si, 6 N'ihi na ndi nka ajuwo miri Shailoa nke nāga nwayọ, ma obi-utọ-ha di n'ebe Rezin na nwa Remalaia nọ; 7 ọbuná n'ihi nka, le, Onye-nwe-ayi nēme ka miri Osimiri rigokwasi ha, bú miri nke di ike di kwa ọtutu, ọbuná eze Asiria na ebube-ya nile: ọ gārigokwasi kwa ebe-ya nile miri si erù, rusa usọ-ya nile: 8 ọ gēruru kwa ba na Juda; ọ gēruchi, gabiga kwa; ọbuná n'olu ka ọ gēru; nsetipu nkù-ya abua gābu kwa ihe juputara obosara ala-gi, Immanuel. 9 Jọnu njọ, unu ndi di iche iche, ma agētipia unu; ṅa-kwa-nu nti, unu ndi nile nọ n'ebe di anya nke uwa: kenu ihe n'úkwù-unu, ma agētipia unu; kenu ihe n'úkwù-unu, ma agētipia unu. 10 Duritanu onwe-unu ọdu, ma agēmebi ya; kwuenu okwu, ma ọ gaghi-eguzosi ike: n'ihi na Chineke nọyere ayi. 11 N'ihi na otú a ka Jehova sirim n'ike nke aka-Ya, O we dọm aka na nti ka m'ghara ije ije n'uzọ ndi nka, si, 12 Unu agaghi-asi, Nkekọta imegide eze, n'ihe nile nke ndi nka nāsi, Ọ bu nkekọta imegide eze; unu agaghi-atu kwa egwu ihe ha nātu egwu ya, unu agaghi-ama-kwa-ra ya jijiji. 13 Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Ya ka unu gēdo nsọ; Ya onwe-ya buru kwa ihe unu nātu egwu, Ya onwe-ya buru kwa ihe nēme ka unu ma jijiji. 14 Ọ gāghọ kwa ebe nsọ; ma Ọ gāghọrọ ulo abua nke Israel nkume ikpọbì-ukwu na oké nkume isu-ngọngọ, Ọ gāghọ-kwa-ra ndi bi na Jerusalem ib͕udu na ọnyà. 15 Ọtutu nime ha gāsu kwa ngọngọ, we da, ewe tipia ha, ha gāma kwa n'ọnyà, ewe nwude ha. 16 Kechie ihe-àmà, kà iwu akàrà n'etiti ndi-nmutam. 17 M'gēchere kwa Jehova, Nke nēzonari ulo Jekob iru-Ya, m'gēle kwa anya Ya. 18 Le, mu onwem na umu nke Jehova nyeworom ibu ihe-iriba-ama na ibu ihe-ebube n'etiti Israel site na Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Onye bi n'ugwu Zaion. 19 Ma mb͕e ha gāsi unu, Juanu ndi nāju mọ ihe ase, ju-kwa-nu ndi-dibia-afa, ndi nēbe ka umu-nnunu, nātamu kwa ntamu: ǹdi ọ bula agaghi-aju Chineke-ya ase? ọ̀ bu n'ihi ndi di ndu ka agāju ndi nwuru anwu ase? 20 Ayi diri iwu, di-kwa-ra ihe-àmà! ọ buru na ha adighi-ekwu dika okwu a si di, n'ezie ọ dighi chi-ọbubọ diri ha. 21 Ha gāgabiga kwa n'etiti ya, na nkpà na agu: ọ gēru kwa, mb͕e agu nāgu ha, na ha gākpasu onwe-ha iwe, ji eze-ha, ji kwa Chineke-ha, kọcha nkọcha, ha gēche iru n'elu: 22 ala ka ha gēlegide kwa anya, ma, le, ahuhu na ọchichiri, bú nb͕achi nke nkpà; ọ bu kwa oké ọchichiri ka aganēnupu ha bà.

Aisaia 9

1 N'ihi ha ọ dighi nb͕achi gādiri nwanyi nke nkpà kpara. Na mb͕e mbu O mere ka elelia ala Zebulun na ala Naftali, ma na mb͕e ikpe-azu ka O meworo ka asọpuru ya, n'uzọ oké osimiri, n'ofè Jọdan, Galili nke mba nile. 2 Ndi nējeghari n'ọchichiri huru ìhè uku: ndi bi n'ala onyinyo ọnwu, ìhè amukwasiwo ha. 3 I mewo ka mba ahu ba uba, I mewo ka ọṅù diri ya uku: ha aṅuriwo n'iru Gi dika ọṅù nke di n'owuwe-ihe-ubi, dika madu si eteghari egwú ọṅù mb͕e ha nēkasa ihe akwatara n'agha. 4 N'ihi na yoke nke ibu-ya, na nkpa-n'aka nke ubu-ya, bú ndele nke onye nāchi ya n'ihe-ike, I nyajiwo ha, dika n'ubọchi nke Midian. 5 N'ihi na akpukpọ-ukwu ọ bula nke ndi-agha nēyi akpukpọ-ukwu n'ùzù agha, na uwe atururu n'ọbara, ha nile gābu ihe isure ọku, ọbuná nri ọku. 6 N'ihi na amuworo ayi otù nwa, otù nwa-nwoke ka enyeworo ayi; ibu-onye-isi gādikwasi kwa n'ubu-ya: agākpọ kwa aha-ya Onye-ebube, Onye-ndum-ọdu, Chineke Nke bu Dike, Nna Nke bu Nna mb͕e nile ebighi-ebi, Onye-isi Udo. 7 Ọ dighi ọgwugwu ọ bula iba-uba nke ibu-onye-isi-Ya na udo-Ya gāgwu, n'elu oche-eze Devid, na n'elu ala-eze-ya, ime ka o guzosie ike, na ikwagide ya n'ikpé ziri ezi na n'ezi omume, site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi. Ekworo Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēme nka. 8 Onye-nwe-ayi zigara okwu ba nime Jekob, o we dabà n'Iarael. 9 Ndi ahu gāma kwa, ha nile, bú Efraim na onye bi na Sameria, ndi nēkwu okwu nime npako na n'oké obi, si, 10 Brick adazuwo, ma nkume awara awa ka ayi gēji wu: eb͕utuzuwo osisi sycomore, ma osisi cedar ka ayi gētiye n'ọnọdu ha. 11 Ma Jehova nēme ka ndi nākpab͕u Rezin nọ n'elu imegide ya, Ọ nākwali kwa ndi-iro-ya; 12 Siria site n'Iru-anyanwu, na ndi Filistia site n'Ọdida-anyanwu; ha nēwere kwa ọnu nile richapu Israel. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti. 13 Ma ndi nka alaghachikuteghi Onye nētib͕u ha, ọ bughi kwa Jehova nke usu nile nke ndi-agha ka ha chọworo. 14 Jehova we nēbipu n'Israel isi na ọdudù, igu-nkwu na amì, n'otù ubọchi. 15 Okenye nke anāhu kwa iru-ọma, onye ahu bu isi; onye-amuma kwa nke nēzí okwu-ugha, onye ahu bu ọdudù. 16 Ndi-nduzi nke ndi nka we ghọ ndi nēme ka ha wagharia; ọzọ, ndi-ha anēduzi eduzi bu ndi anēloda eloda. 17 N'ihi nka Onye-nwe-ayi agaghi-aṅuri ọṅu n'aru umu-okorọbia-ha, Ọ gaghi-enwe kwa obi-ebere n'aru umu-nb͕ei-ha na ndinyom-ha di-ha nwuru: n'ihi na onye ọ bula nime ha bu onye emeruru emeru na onye nēme ihe ọjọ, ọnu ọ bula nēkwu kwa ihe-nzuzu. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti. 18 N'ihi na nmebi-iwu erewo dika ọku; ogwu na uke ka o nērichapu: ọ nēnwu kwa ọku n'alughi-ulù nile nke oké ọhia, ha we kwulie elu na nkwuli-elu nke anwuru-ọku. 19 Nime nrubiga-ókè-iwe nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha ka erechapuworo ala: ndi nka we di ka nri ọku; onye ọ bula adighi-enwe ọmiko n'aru nwa-nne-ya. 20 O we b͕utue n'aka-nri, ma agu nāgu ya: ọ we rie ihe n'aka-ekpe, ma afọ ejughi ha: ha gēri, onye ọ bula anu-aru nke ogwe-aka-ya: 21 Manase gēmegide Efraim, Efraim gēmegide kwa Manase: ndi ahu abua gēmegide Juda. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.

Aisaia 10

1 Ahuhu gādiri ndi nātọ ukpuru di iche iche nke ajọ ihe, na ndi-ode-akwukwọ nke deworo nmeb͕u n'akwukwọ: 2 iwezuga ndi nēnweghi ike n'ezi ikpé, na inapu ikpé ziri ezi nke ndi ewedara n'ala nke ndim, ka ndinyom di-ha nwuru we buru ihe ha kwatara n'agha, ka ha we luta kwa ihe umu-nb͕ei n'agha! 3 Ọ̀ bu kwa gini ka unu gēme n'ubọchi nleta, na n'ila-n'iyì nke gēsi n'ebe di anya bia? Ònye ka unu gāb͕akuru ka o we yere unu aka? ọ̀ bu kwa ole ebe unu gārapu nsọpuru-unu? 4 Ọ bu nání na ọ makpuworo n'ọnọdu onye-nkpọrọ, ọ bu kwa n'ọnọdu ndi eb͕uru eb͕u ka ha gāda. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti. 5 Ahuhu gādiri Asiria, bú ndele nke iwem, nkpa-n'aka ka ọ bu kwa n'aka-ha, bú oké iwem! 6 Imegide mba emeruru emeru ka M'nēziga ya, bayere ndi nke nrubiga-ókè-iwem ka M'nēnye kwa ya iwu, ikwata ihe-nkwata n'agha, na iluta ihe-nluta n'agha, na ido ha ihe-nzọtọ dika apiti nke èzí. 7 Ma ya onwe-ya, ọ bughi otú a ka ọ nēzube, obi-ya kwa, ọ bughi otú a ka ọ nēchè; kama ikpochapu ekpochapu di n'obi-ya, ya na ibipu ọtutu mba. 8 N'ihi na ọ nāsi, Ndi-isim, hà nile abughi ndi-eze? 9 Kalno, ọ̀ dighi ka Kakemish? ma-ọbu Hemat, ọ̀ dighi ka Apad? ma-ọbu Sameria, ọ̀ dighi ka Damaskọs? 10 Dika akam chọtaworo ala-eze nile nke ihe-efu, ndi arusi-ha apiri api kariri nke Jerusalem, kari kwa nke Sameria; 11 dika m'meworo Sameria, me kwa ihe-efu-ya nile, ọ̀ bughi otú a ka m'gēme Jerusalem, me kwa ihe-efu-ya nile? 12 Ọ gēru kwa, mb͕e Onye-nwe-unu gālubì ọlu-Ya nile n'ugwu Zaion na nime Jerusalem, na M'gēleta nkpuru nke oké obi eze Asiria, leta kwa ima-nma nke anya npako ya. 13 N'ihi na ọ siwo, Site n'ike akam ka m'meworo ya, na site n'amam-ihem; n'ihi na enwerem nghọta: m'we wezuga ókè ndi nile di iche iche, ọzọ, ihe-ha nke ejikereworo ka m'punara ha, m'we buda, dika onye di ike, ndi nānọdu n'ọche-eze; 14 akam achọtawo kwa àkù ndi nile di che iche dika akwu; na dika madu si achikọta àkwá arapuru arapu, otú a uwa nile ka mu onwem chikọtaworo: ma ọ dighi nke nēmeghari nkù, ma-ọbu nke nāsaghe ọnu, ma-ọbu nke nēbe ebe. 15 Anyu-ike, ọ̀ ga-egbu onwe ya n'aru onye ji ya eb͕u ihe? ma-ọbu mma-nkwọ, ọ̀ gēme onwe-ya uku megide onye nākwọ ya? dika agāsi na ndele gēfeghari ndi nēbuli ya, dika agāsi na nkpa-n'aka gēbuli onye nābughi osisi. 16 N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, gēziga ọtita-aru n'etiti ndi-ya mara abuba: ọ bu kwa n'okpuru nsọpuru-ya ka agāmuye nmuye dika nmuye nke ọku. 17 Ìhè Israel gāghọ kwa ọku, Onye Nsọ ya gāghọ kwa onwunwu-ọku, we re ọku richapu uke-ya na ogwu-ya n'otù ubọchi. 18 Ọ gēme kwa nsọpuru nke oké ọhia-ya na nke ubi ọma ya ka ọ gwusia, ma nkpuru-obi ma anu-aru: ọ gādi kwa ka ọtita-aru nke onye-ọria. 19 Ma osisi nke fọduru n'oké ọhia-ya gādi ole-na-ole n'ọnu-ọgugu, nwata gēdeta kwa ha n'akwukwọ. 20 Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na ndi Israel fọduru, ha na ndi ulo Jekob ndi bapuru ab͕apu, agaghi-adabere kwa ọzọ n'aru onye nētib͕u ha; kama ha gādabere Jehova, bú Onye Nsọ nke Israel, n'ezi-okwu. 21 Ndi fọduru gālaghachikute Chineke Nke bu dike, bú ndi Jekob fọduru. 22 N'ihi na ọ buru na ndi-gi, Israel, adi ka ájá oké osimiri, nání ndi fọduru nime ha gālata: nkpochapu ka akaworo àkà, nke nērubiga ókè n'ezi omume. 23 N'ihi na ngwusi, nke aka-kwa-ra àkà, ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nēme n'etiti uwa nile. 24 N'ihi nka otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, siri, Gi ndim nke bi na Zaion, atula egwu Asiria: ọ bu ezie na o ji ndele tie gi, weli kwa nkpa-n'aka-ya megide gi, otú Ijipt mere. 25 N'ihi na ọ fọduru nwa mb͕e ntà, oké iwe ewe gwusia, iwem gēme kwa ka ha ka nká. 26 Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēfeghari kwa utali n'elu ya, dika ntib͕u Midian n'oké nkume Oreb: nkpa-n'aka-Ya gādi kwa n'elu oké osimiri, Ọ gēweli kwa ya otú O mere n'Ijipt. 27 Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na ibu arọ́ ya gēwezuga onwe-ya n'ubu-gi, yoke-ya gēwezuga kwa onwe-ya n'olu-gi, e, agēmebi yoke site na manu. 28 Ọ biakwasiwo Aiat, ọ gabigawo n'etiti Migron; na Mikmash ka ọ debeworo ihe-ya nile: 29 ha agabigawo uzọ-ngabiga; Geba bu ebe-inọ-ọnọdu-abali ayi gēnwe, ka ha kwuru: Rema nāma jijiji, Gibea nke Sọl ab͕alagawo. 30 Were olu-gi tisie nkpu ike, ada Galim! ṅa nti, gi Laisha! Éwù, Anatot nke ewedara n'ala! 31 Madmena awaghariwo; ndi bi na Gibim gēme ka ndi-ha laghachi n'ulo ọsọsọ. 32 Ubọchi nke ta ọ bu nime Nob ka o gēguzo: ọ nēfeghari aka-ya n'ebe ugwu ada Zaion di, bú ugwu ntà Jerusalem. 33 Le, Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nēwere ihe nākpata ima-jijiji kwachapu ngalaba: anēb͕utu kwa ndi topuworo elu, anēme kwa ndi di elu ka ha di ala. 34 Ọ gēwere kwa ígwè b͕utusia alughi-ulù nile nke oké ọhia, Lebanon gēsite kwa n'aka onye di ike nke-uku da.

Aisaia 11

1 Ome gēsi kwa n'ogwe-osisi Jesi puta, otù alaka nke sitere na nkpọrọgwu-ya gāmi kwa nkpuru: 2 Mọ nke Jehova gēnwe kwa ọnọdu-Ya n'aru ya, bú Mọ nke amam-ihe na nghọta, Mọ nke ndum-ọdu na idi-ike, Mọ nke ihe-ọmuma na egwu Jehova; 3 ọzọ, ihe nātọ ya utọ bu egwu Jehova: ọ bughi kwa dika anya-ya abua si ahu ka ọ gēkpe ikpe, ọ bughi kwa dika nti-ya abua si anu ka ọ gāba nba: 4 kama ọ gēji ezi omume kpe ndi nēnweghi ike ikpe, ọ gēji kwa izi-ezi ba nba bayere ndi di ume-ala n'obi n'uwa: ọ gēji kwa ndele nke ọnu-Ya tib͕ue uwa, ọ gēji kwa iku-ume nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua me ka ndi nēmebi iwu nwua. 5 Ezi omume gābu kwa ihe-ọkiké ume-Ya, ikwesi-ntukwasi-obi gābu kwa ihe-ọkiké úkwù-Ya. 6 Anu-ọhia wolf na nwa-aturu gānọ kwa, agu na nwa-ewu gāmakpukọ kwa; nwa-ehi na nwa-ọdum na nwa anu emere ka ọ ma abuba gādi kwa n'otù ebe; nwatakiri ganēdu kwa ha. 7 Nne-ehi na anu-ọhia bear gātakọ kwa nri; umu-ha gāmakpukọ: ọdum gāta kwa okporo-ọka dika ehi. 8 Nwa nāṅu ara gēgwuri kwa egwú n'elu ọnu aju-ala nọ, ọ bu kwa anya ubí ka nwa emere ka ọ rapu ara gātukwasi aka-ya. 9 Ha agaghi-eme ihe ọjọ, ha agaghi-ebibi kwa, n'ugwu nsọm nile: n'ihi na ihe-ọmuma Jehova gējuputa uwa, dika miri si ekpuchi oké osimiri. 10 Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na nkpọrọgwu Jesi, nke nēguzo ibu ọkọlọtọ ndi nile di iche iche, ya ka mba nile gāju ase; ebe-izu-ike-ya gābu kwa ebube. 11 Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na Onye-nwe-ayi gēseti kwa aka-Ya ọzọ nke ub͕ò abua inweta ndi-Ya fọduru, bú ndi gāfọdu, site n'Asiria, site kwa n'Ijipt, site kwa na Patros, site kwa na Kush, site kwa n'Ilam, site kwa na Shaina, site kwa na Hemat, site kwa n'agwe-etiti nile nke oké osimiri. 12 Ọ gēbuli-kwa-ra mba nile ọkọlọtọ, we chikọta ndi Israel achupuru achupu, ndi Juda b͕asara ab͕asa ka Ọ gēsi na nkuku anọ nke uwa kpọkọputa kwa. 13 Ekworo nke Efraim gēwezuga kwa onwe-ya, agēbipu kwa ndi nākpab͕u Juda: Efraim agaghi-ekwoso Juda ekworo, Juda agaghi-akpab͕u kwa Efraim. 14 Ha gēfedakwasi n'ubu ndi Filistia n'Ọdida-anyanwu; ha abua gādi n'otù luta ihe umu Iru-anyanwu n'agha: n'aru Edom na Moab ka ha ganēseti aka-ha; umu Amon ganānu kwa olu-ha. 15 Jehova gēwezuga ire oké osimiri nke Ijipt ka ebibie ya; Ọ gēji kwa okpom-ọku nke ifufe-Ya feghari aka-Ya n'elu Osimiri, tiputa ya iyi asa, me ka madu zọ ya ukwu n'akpukpọ-ukwu. 16 Uzọ atuliri atuli gādi-kwa-ra ndi-Ya fọduru, bú ndi gāfọdu, site n'Asiria; dika o si diri Israel n'ubọchi o siri n'ala Ijipt rigoputa.

Aisaia 12

1 I gāsi kwa n'ubọchi ahu, M'gēkele Gi, Jehova; N'ihi na ọ bu ezie na I wesaram iwe, ma iwe-Gi alaghachiwo azu, I we kasiem obi. 2 Le, Chineke bu nzọputam; m'gātukwasi Ya obi, ghara itu egwu: n'ihi na ikem na abù ọmam ka Ja JEHOVA bu; O we ghọrọm nzọputa. 3 Unu gēji kwa obi-utọ seputa miri n'isi-iyi nile nke nzọputa. 4 Unu gāsi kwa n'ubọchi ahu, Kelenu Jehova, kpọkuenu aha-Ya, menu ka amara omume-Ya nile n'etiti ndi nile di iche iche, hotanu na emewo ka aha-Ya di elu. 5 Bùkuenu Jehova abù ọma; n'ihi na ihe-ọkaka ka O meworo: emewo ka amara nka n'uwa nile. 6 Tisie nkpu ike, kpọ nkpu ọṅù, gi nwanyi bi na Zaion n'ihi na onye uku n'etiti gi ka Onye Nsọ nke Israel bu.

Aisaia 13

1 Ibu eboro Babilon, nke Aisaia nwa Emoz huru. 2 Bulienu ọkọlọtọ n'elu ugwu nke osisi nādighi, welierenu ha olu, fenu aka, ka ha we ba n'ọnu-uzọ nile nke ndi amara aha-ha. 3 Mu onwem enyewo ndim edoworo nsọ iwu, akpọwokwam ndi-dikem imezu ihe iwem chọrọ, bú ndim nāṅuri ọṅu-agha nime npako. 4 Nuru olu ìgwè n'ugwu nile, yiri nke ndi bara uba! nuru olu nkpotu ala-eze nile nke mba nile achikọtaworo! Jehova nke usu nile nke ndi-agha nāgukọta usu-ndi-agha ibu agha. 5 Ha nēsi n'ala di anya abia, na nsọtu elu-igwe, bú Jehova na ihe-agha nile nke oké iwe-Ya, emebi ala nka nile. 6 kwasienu ákwá ike; n'ihi na ubọchi Jehova di nso; dika nbibi nke sitere n'aka Onye puru ime ihe nile ka ọ gābia. 7 N'ihi nke a-aka nile gākuda, obi ọ bula nke madu gālọ kwa ya miri: 8 ha gāma kwa jijiji; aru-ufu na ihe-nb͕u ka ha gēnwezu; dika nwanyi ime nēme, otú a ka ha gāb͕ali: ọ gēju ha anya, otù n'ebe ibe-ya nọ; iru nke bu nání ire-ọku ka iru-ha gābu. 9 Le, ubọchi Jehova, bú ubọchi nēnweghi obi-ebere, nābia, ya na nrubiga-ókè nke iwe na iwe di ọku; ime ka ala nka ghọ ebe tọbọrọ n'efu na ikpochapu ndi-nmehie nime ya. 10 N'ihi na kpakpando nile nke elu-igwe na Oriọna-ha nile agaghi-eme ka ìhè-ha nwue: anyanwu gāb͕a ọchichiri n'ọwuwa-ya, ọzọ, ọnwa agaghi-eme ka ìhè-ya tie. 11 M'gēwere kwa ihe ọjọ ya leta elu-uwa dum madu bi, were kwa ajọ omume-ha leta ndi nēmebi iwu; M'gēme kwa ka npako nke ndi-nganga kwusi, M'gēme kwa idi-elu nke ndi nēme ka madu ma jijiji ka ọ di ala. 12 M'gēme ka madu di ukọ kari ọla-edo anuchara anucha, ọbuná madu efu kari ọla-edo ọma nke Ofia. 13 N'ihi ya ọbuná elu-igwe ka M'gēme ka ha ma jijiji, uwa gēme kwa nkpatu pua n'Ọnọdu-ya, nime nrubiga-ókè nke iwe Jehova nke usu nile nke ndi-agha, na n'ubọchi iwe-Ya di ọku. 14 Ọ gēru kwa, na ha gēche iru, onye ọ bula n'ebe ndi-ya nọ, ha gāb͕alaga kwa, onye ọ bula rue ala-ya, dika mb͕ada anāchu achu, na dika ìgwè ewu na aturu, nke ọ nādighi onye nāchikọta ha. 15 Onye ọ bula anāchọta, amapue ya; onye ọ bula anējide, ọ da site na mma-agha. 16 Agātupia kwa umu-ha nāṅu ara n'anya-ha; agāpunara ha ulo-ha, merua ndinyom-ha. 17 Le, M'nākpọte ndi Midia imegide ha, ndi nādighi-agu ọla ọcha n'ihe, ọla-edo kwa, ọ dighi-atọ ha utọ. 18 Uta-ha nātupia kwa umu-okorọbia; ha adighi-enwe kwa obi-ebere n'aru nkpuru nke afọ; anya-ha adighi-emekwara umu ebere. 19 Babilon, bú ihe mara nma nke ala-eze nile, ima-nma nke npako ndi Kaldea, ọ gādi ka mb͕e Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra. 20 Ọ gaghi-abu ebe-obibi ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi; agaghi-ebi kwa nime ya rue ọb͕ọ nile: onye Arebia agaghi-ama kwa ulo-ikwū-ya n'ebe ahu; ndi-ọzùzù-aturu agaghi-eme kwa ka aturu-ha makpue n'ebe ahu. 21 Ma anu-ọhia di iche iche bi n'ala kpọrọ nku gāmakpu n'ebe ahu; ulo-ha gējuputa kwa n'okwukwu; enyi-nnunu gēbi kwa n'ebe ahu, nkpi gāmali kwa elu n'ebe ahu. 22 Anu-ọhia nēbe ebe gāzarita kwa onwe-ha n'ulo ọma ya nile, nkita-ọhia kwa n'ulo uku nile nke ihe-utọ: mb͕e-ya di kwa nso ibia, agaghi-eme kwa ka ubọchi-ya di ogologo.

Aisaia 14

1 N'ihi na Jehova gēnwe obi-ebere n'aru Jekob, Ọ gārọputa kwa Israel ọzọ, do ha n'ala-ha: ọbìa gārapara kwa n'aru ha, ha gēme kwa onwe-ha ka ha na ulo Jekob dikọ n'otù. 2 Ndi nile di iche iche gēkuru kwa ha, me ka ha biarue ọnọdu-ha: ulo Israel gēketa kwa ha n'ala Jehova ibu ndi-orù na ibu ndinyom nēje ozi: ha gāghọ kwa ndi nādọta ndi nādọta ha-ri n'agha n'agha; ha gēnwe kwa ike n'aru ndi nāchi ha-ri n'ihe-ike. 3 Ọ gēru kwa, n'ubọchi Jehova gēme ka i zu ike pua n'ihe-nb͕u-gi, na n'ihe-nwute-gi, na n'òfùfè ahu siri ike nke emere ka i fè nime ya, 4 na i gātu ilu a megide eze Babilon, si, Le, otú onye nāchi n'ihe-ike kwusiworo! le, otú obodo ọla-edo kwusiworo! 5 Jehova anyajiwo nkpa-n'aka nke ndi nēmebi iwu, ndele nke ndi nāchi achi; 6 nke were ntib͕u nēwezugaghi onwe-ya etib͕u ndi nile di iche iche nime nrubiga-ókè nke iwe, nke were nzogbu anēb͕ochighi azọb͕u mba nile n'iwe. 7 Uwa nile ezuwo ike, di jū: ha etiwawo nkpu ọṅù. 8 Ọbuná osisi fir aṅuriwo ọṅu megide gi, ha na osisi cedar nke Lebanon, si, Site na mb͕e i dinaworo, onye-nb͕utu adighi-arigota megide ayi. 9 Ala-mọ site n'okpuru emeworo gi nkpatu izute gi n'ọbibia-gi: ọ nākpọtere gi ndi nādighi ndu, bú nkpi nile nke uwa; o mewo ka eze nile nke mba nile si n'oche-eze-ha bilie. 10 Ha nile gāza, si gi, Gi onwe-gi kwa, èmewo ka i ghara ídi ike dika ayi? ì ghọwo onye yiri ayi? 11 Emewo ka nbili-elu-gi ridarue ala-mọ, ya na olu une-gi nile: n'okpuru gi ka ab͕asaworo ikpuru, ihe-nkpuchi-gi bu kwa ikpuru. 12 Le, otú i siworo n'elu-igwe da, gi Lusifa, nwa chi-ọbubọ! le, otú eb͕utuworo gi n'ala, gi onye nēme ka ike gwu mba nile! 13 Gi onwe-gi we si n'obi-gi, N'elu-igwe ka m'gārigo, n'elu kpakpando nile nke Chineke ka m'gēbuli oche-ezem; m'gānọkwasi kwa n'ugwu nzukọ, na nsọtu nile nke Ugwu: 14 m'gārigo n'elu ebe nile di elu nke igwe-oji; m'gēyi Onye kachasi ihe nile elu. 15 Otú ọ di, rue ala-mọ ka agēme ka i rida, rue nsọtu nile nke olùlù. 16 Ndi nāhu gi gēlegide gi anya, lekwasi gi anya, si Ọ̀ bu nka bu nwoke ahu nke nēme ka uwa ma jijiji, nke nēme ka ala-eze di iche iche me nkpatu; 17 nke mere elu-uwa dum madu bi ka ọ di ka ọzara, nke kwada-kwa-ra obodo-ya nile; nke nātọpughi ndi-nkpọrọ-ya ka ha la? 18 Eze nile nke mba nile, ọbuná ha nile, edinawo n'ala nime nsọpuru, onye ọ bula n'ulo-ya. 19 Ma gi onwe-gi, esiwo n'ílì-gi tupu gi dika alaka nke bu ihe-árú, yiri ndi eb͕uru eb͕u dika uwe, bú ndi ejiworo mma-agha dupú, ndi nāridaru nkume nke olùlù; dika ozu azọrọ ukwu. 20 Gi na ha agaghi-abu otù n'olìlì, n'ihi na ala-gi ka i bibiworo, ndi-gi ka i b͕uworo; nkpuru nke ndi nēme ihe ọjọ, agaghi-akpọ aha-ha rue mb͕e ebighi-ebi. 21 Dozierenu umu-ya ebe-ob͕ub͕u n'ihi ajọ omume nke ndi bu nna-ha; ka ha we ghara ibili, nweta uwa, me ka elu-uwa dum madu bi juputa n'obodo. 22 M'gēbili kwa megide ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), M'gēbipu kwa na Babilon aha na ndi fọduru, na umu na umu umu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 23 M'gēme kwa ya ka ọ ghọ ihe-nnweta nke ebinta, na ọdọ-miri ọdọ-miri; M'gewere kwa aziza, bú nkpochapu, zachapu ya; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta. 24 Jehova nke usu nile nke ndi-agha aṅuwo iyi, si, N'ezie dika M'chèworo, otú a ka ọ gādi; na dika M'zubeworo, nke ahu gēguzosi ike: 25 na M'gētipia Asiria n'alam, ọ bu kwa n'elu ugwum nile ka M'gāzọ ya ukwu: yoke-ya gēsi kwa n'olu-ha wezuga onwe-ya, ibu-ya gēsi n'elu ubu-ha wezuga onwe-ya. 26 Nka bu nzube ahu nke anēzube n'elu uwa nile: nka bu kwa aka ahu nke anēseti n'aru mba nile. 27 N'ihi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezubewo; ònye gēmebi kwa ya? aka-Ya esetiwo kwa; ònye gēme kwa ka ọ laghachi azu. 28 N'arọ ọnwu eze, bú Ehaz, ka ibu a di. 29 Aṅurila ọṅu, gi Filistia, ka i ra, n'ihi na anyajiwo ndele nke nēti gi-ri: n'ihi na ihe nke gēsi na nkpọrọgwu agwọ puta bu ubí, nkpuru-ya gābu kwa agwọ yiri ọku nēfe efe. 30 Ndi bu ọkpara nke ndi nēnweghi ike gāzù kwa onwe-ha dika aturu, ndi-ob͕eye gāmakpu kwa na ntukwasi-obi: ma M'gēme ka nkpọrọgwu-gi nwua site n'oké unwu, ọ bu kwa ndi-gi fọduru ka o gēb͕u. 31 Kwasie ákwá ike, gi ọnu-uzọ-ama; tie nkpu, gi obodo; i b͕azewo, Filistia, ka i ra; n'ihi na n'Ugwu ka anwuru-ọku si bia, ọ dighi kwa onye ọ bula nēguzo iche na mb͕e-ya nile akara àkà. 32 Gini kwa ka madu gāza ndi-ozi nke mba? Na Jehova atọwo ntọ-ala Zaion, ọ bu kwa nime ya ka ndi ewedara n'ala nke ndi-Ya gāb͕abà.

Aisaia 15

1 Ibu ebero Moab. N'ihi na n'otù abali ka ebibiworo Ai nke Moab, me ka ọ la n'iyì; n'ihi na n'otù abali ka ebibiworo Kia nke Moab, me ka ọ la n'iyì. 2 Ọ rigowo n'ulo, ọbuná Dibon, n'ebe-ya di elu, ikwa ákwá: n'aru Nebo na n'aru Medeba ka Moab nākwasi ákwá ike: n'isi-ha nile ka nkwọcha-isi di, afu-ọnu nile ọ bula ka ebipuworo. 3 N'èzí-ya nile ka ha keworo ákwà-nkpe: n'elu ulo-ya nile na n'amá-ya nile ka onye ọ bula nākwasi ákwá ike, nākwab͕u onwe-ya. 4 Heshbon nēti kwa nkpu, ya na Eleale: rue Jehaz ka anānu olu-ha: n'ihi nka ndi ejikere ibu agha nke Moab nētisi nkpu ike; nkpuru-obi-ya nāma jijiji nime ya. 5 Obim nētiri Moab nkpu; ndi-ọ̀sọ́-ya, nāb͕a ọsọ rue Zoa, rue Eglat-shelishiya: n'ihi na nrigo Luhit, o ji ikwa-ákwá arigo na ya; n'ihi na n'uzọ Horonaim ka ha nētisi nkpu ntikpọ ike. 6 N'ihi na miri Nimrim gābu nání ebe tọb͕ọrọ n'efu: n'ihi na ahihia akpọnwuwo, ahihia ndu agwusiwo, akwukwọ ndu adighi. 7 N'ihi nka ihe o nwebigara ókè nke o nwetara, na ihe ha kpakọbaworo, n'ofè iyi osisi willow ka ha gēbulaga ha. 8 N'ihi na iti-nkpu adazuwo udà n'ókè-ala Moab buruburu; n'Eglaim ka ákwá ọ nākwasi ike daruworo, ọ bu kwa na Bia-ilim ka ákwá ọ nākwasi ike daruworo. 9 N'ihi na miri Dimon juputara n'ọbara: n'ihi na M'gātukwasi kwa n'aru Dimon ihe ọzọ, ndi Moab nke b͕apuru ab͕apu ka M'gātukwasiri ọdum, tukwasi-kwa-ra ndi ala-ha fọduru.

Aisaia 16

1 Sinu na Sela n'uzọ ọzara zigara onye nāchi ala umu-aturu, rue ugwu ada Zaion. 2 O gēru kwa na, dika anu-ufe nke nēfefu efefu, dika akwu-nnunu achusara achusa, otú a ka umu-ndinyom Moab gādi na ngabiga-miri diri Anon. 3 Dua ọdu, menu ihe ekpere n'ikpe; me ka ǹdò-gi di ka abali n'etiti oké ehihie: zobe ndi achupuru achupu; ekpughela onye nāwaghari. 4 Ka ndim achupuru achupu nọ dika ọbìa n'etiti gi; Moab, ghọrọ ya ebe nzuzo izopu ya n'iru onye nāpunara ya ihe: n'ihi na onye-nkpab͕u nwere ọgwugwu, ihe-ike agwusiwo, ndi nāzọda madu agwuchapuwo n'ala. 5 Agēme kwa ka otù oche-eze guzosie ike n'ebere, otù onye gānọkwasi kwa ya n'ezi-okwu, n'ulo-ikwū Devid; bú onye nēkpe ikpe, nāchọ kwa ikpé ziri ezi, nēme kwa ngwa ime ezi omume. 6 Ayi anuwo ihe bayere npako Moab, na ọ nāpako npako nke-uku; ọbuná ihe bayere nganga-ya, na npako-ya, na nrubiga-ókè-iwe-ya; ihe nēzighi ezi ka ekwukwu-ya nile bu. 7 N'ihi nka ka Moab gākwasiri Moab ákwá ike, ọ gākwasi ákwá ike, ka ọ ra: iri mbadamba nkpuru-vine nke Kia-hareset ka unu gātamu ntamu, ebe unu bu nání ndi apiaworo ihe. 8 N'ihi na ubi nile nke Heshbon nātalata, ha na osisi vine nke Sibma; ndi-nwe mba nile ka osisi vine ya kachasi nma tib͕uworo; ọbumá na Jeza ka ha ruru, ha waghariri n'ọzara; alaka-ya wasara awasa, ha gabigara oké osimiri. 9 N'ihi nka m'gēji ikwa-ákwá nke Jeza kwara osisi vine nke Sibma: m'gēji anya-mirim dè gi dika miri-ozuzo, gi Heshbon, na Eleale: n'ihi na n'elu nghọkọta-nkpuru-gi na n'elu owuwe-ihe-ubi-gi ka iti-nkpu-agha daworo. 10 Ewepuwo kwa ọṅù na iteghari-egwú-ọǹù n'ubi ọma; agaghi-eti kwa nkpu ọṅù tisie ya ike n'ubi-vine nile: onye-nzọcha agaghi-azọchaputa manya-vine n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine nile; emewom ka iti-nkpu nzọcha-nkpuru-vine kwusi. 11 N'ihi nka ngiri-afọm nādara Moab udà dika ubọ-akwara, ime-afọm nāda-kwa-ra Kia-heres. 12 O gēru kwa, mb͕e o mere ka ahu ya, mb͕e ike gwuru ya, bú Moab, n'elu ebe-ya di elu, mb͕e ọ gābiaru ebe nsọ ya ikpe ekpere, na ọ gaghi-enwe ike. 13 Nka bu okwu ahu nke Jehova kwuru bayere Moab na mb͕e gara aga. 14 Ma ub͕u a Jehova ekwuwo, si, N'arọ atọ, dika arọ onye egoro ọlu, ka agēlelì nsọpuru Moab, ya na ìgwè madu-ya nile bara uba; ndi fọduru gādi kwa ntà nke-uku, nādighi ike.

Aisaia 17

1 Ibu eboro Damaskọs. Le, ewezugawo Damaskọs n'ibu obodo, o we ghọ obo-ihe dara ada. 2 Arapuwo obodo nile nke Aroea, ìgwè di iche iche aturu ka ha gādiri, nke gāmakpu, ọ dighi kwa onye nēme ka ha ma jijiji. 3 Ebe ewusiri ike gāgwupu n'Efraim, ala-eze gāgwupu kwa na Damaskọs, ya na ndi Siria fọduru; dika nsọpuru umu Israel ka ha gādi, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta. 4 Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na agēme ka nsọpuru Jekob ghara inwe ike, ima-abuba nke anu-aru-ya gāta kwa ata. 5 Ọ gādi kwa ka mb͕e onye nēwe ihe ubi nēkpokọta ọka guzo ọtọ, ogwe-aka-ya anēwe oko ọka; ọ gādi kwa ka mb͕e anāchikọta oko ọka dara ada na ndagwurugwu Refaim. 6 Ma nkpuru nke fọduru itutukọ gāfọdu nime ya, dika ntisisi nke osisi olive, nkpuru abua ma-ọbu atọ n'elu ngalaba osisi kachasi elu, anọ ma ọbu ise n'alaka-ya nile, bú nke osisi nāmi nkpuru, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova, bú Chineke Israel, puta. 7 N'ubọchi ahu ka madu gēle Onye kèworo ya anya ọma, anya-ya abua gēlekwasi kwa Onye Nsọ nke Israel. 8 Ma ọ gaghi-ele ebe-ichu-àjà ahu nile anya ọma, bú ọlu aka-ya, ọ bughi kwa ihe nkpisi-aka-ya meworo ka ọ gēle anya, ma ọ bu Asherim, ma-ọbu arusi-anyanwu-ya nile. 9 N'ubọchi ahu obodo-ya nile nke siri ike gādi ka ebe arapuru arapu nke oké ọhia na nke elu ugwu, nke ha rapuru n'iru umu Israel: ọ gābu kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu. 10 N'ihi na i chezọwo Chineke nke nzọputa-gi, na n'ihi na i chetaghi oké nkume ahu, bú ebe-gi siri ike; n'ihi nka ka i nāku ihe-ọkuku di iche iche nke di utọ, ọ bu kwa alaka osisi vine nke ala ọzọ ka i nāma nime ya: 11 n'ubọchi ọkukú-gi i nāb͕a ya ogige buruburu, ọ bu kwa n'ututu ka i nēme ka nkpuru-gi ma ifuru: ma obo-ihe ka owuwe-ihe-ubi gābu n'ubọchi ọria na ihe-nb͕u nādighi-agwọta. 12 Ahuhu! ọ bu ùzù ọtutu ndi, dika ùzù nke oké osimiri ka ha nātu ùzù; ọ bu kwa nkpọtu nke mba di iche iche, dika nkpọtu nke ọtutu miri ka ha nākpọtu. 13 Mba di iche iche, dika nkpọtu nke miri di ike ka ha nākpọtu: ma Ọ nābasiri ya nba ike, o we b͕alaga n'ebe di anya, anāchi kwa ya dika ib͕ob͕o-ọka nke ugwu n'iru ifufe, na dika ihe anēfeghari buruburu n'iru oké ifufe. 14 Na mb͕e anyasi le, oké egwu di: tutu ututu erue ọ dighi. Nka bu òkè nke ndi nāpunara ayi ihe; na ihe ruru ha n'ife-nzà, bú ndi nāluta ihe-ayi n'agha.

Aisaia 18

1 Ahuhu gādiri ala ùzù nke ọtutu nkù, nke di n'ofè osimiri nile nke Etiopia: 2 nke nēziga ndi-ukọ̀ n'oké osimiri, ọbuná n'ub͕ọ papyrus di iche iche n'elu miri! Unu ndi-ozi nkọ, jekurunu otù mba ndi di ogologo di kwa lari n'aru, rue otù ndi di egwu site na nmalite-ya ga n'iru; bú mba nātùta atùta nāzọda kwa azọda, nke osimiri di iche iche kewaworo ala-ya! 3 Unu ndi nile nēbi n'elu-uwa dum madu bi, na unu ndi nwere ebe-obibi-unu n'uwa, mb͕e anēbuli ọkọlọtọ n'elu ugwu nile, hunu; ọzọ mb͕e anāfù opi-ike, nurunu, 4 N'ihi na otú a ka Jehova siworom, M'gānọ jū, M'gēlegíde kwa anya n'ebem guzosiri ike; dika okpom-ọku nēnwu enwu n'ìhè anyanwu, dika alulu igirigi n'okpom-ọku nke owuwe-ihe-ubi. 5 N'ihi na tutu owuwe-ihe-ubi erue, mb͕e ifuru zusiri okè, na mb͕e okoko nāghọ nkpuru-vine nāchaghi acha, O gēji mma-nkwacha bipu umu-alaka-ya, ọ bu kwa alaka-ya nile ka Ọ gēwezuga b͕uchapu. 6 Agārapu ha n'otù nye udele nke ugwu, nye kwa anu-ọhia nke uwa: udele gānọkwasi kwa ha ogologo mb͕e okpom-ọku, anu-ọhia nke uwa gānọkwasi kwa ha ogologo mb͕e oyi. 7 Na mb͕e ahu ka agēdukuru Jehova nke usu nile nke ndi-agha ùtú, nke bu otù ndi di ogologo di kwa lari n'aru, nke site-kwa-ra n'otù ndi di egwu site na nmalite-ya ga n'iru; bú mba nātùta nāzọda kwa azọda, nke osimiri di iche iche kewaworo ala-ya, rue ọnọdu aha Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú ugwu Zaion.

Aisaia 19

1 Ibu eboro Ijipt. Le, n'igwe-oji nke nāb͕a ọsọ ka Jehova nānọkwasi dika inyinya, O we bia rue Ijipt: ihe-efu nile nke Ijipt gēme kwa nkpatu n'iru Ya, obi Ijipt gālọ kwa ya miri n'etiti ya. 2 M'gākwali kwa Ijipt megide Ijipt: ha gēbu kwa agha, onye ọ bula megide nwa-nne-ya, onye ọ bula megide kwa ibe-ya, obodo megide obodo, ala-eze megide ala-eze. 3 Ewe wusi mọ Ijipt n'etiti ya; ndum-ọdu-ya ka M'gēloda kwa: ha gāju kwa ihe-efu nile ha ase, ju kwa ndi-ntamu-ha, ju kwa ndi nāju mọ ihe, ju kwa ndi-dibia-afa. 4 M'gēmechibido Ijipt n'aka onye-nwe-ha nēme ihe-ike; eze di ike gāchi kwa ha, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, puta. 5 Ọzọ, miri gātada n'oké osimiri, osimiri gātasia takọrọ. 6 Osimiri-ya nile gēsì kwa ísì; osimiri Nail nile nke Ijipt gātalata we tasia: amì na achara gājanwu. 7 Ala ahihia ndu n'akuku Nail, n'usọ Nail, na ebe ọ bula anāgha nkpuru n'akuku Nail, gātakọrọ, efesa ha, ha we ghara idi. 8 Ndi-ọkù gēze kwa ume, ndi nile ndi nātubà nko-azù nime Nail gēru kwa újú, ndi nāb͕asa ub͕u n'elu miri gāta kwa aru. 9 Ọzọ, ihere gēme ndi nālu ọlu flax etiri eti na ndi nākpa ákwà ọcha. 10 Ide-ya nile gāghọ ihe etipiara etipia, ndi nile nke nālu ọlu inara ugwọ-ọlu gābu ndi erudara eruda na nkpuru-obí. 11 Nání ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha ka ndi-isi Zoan bu; ndum-ọdu nke ndi mara ihe nime ndi-ndum-ọdu Fero aghọwo ndum-ọdu anu-ọhia: ùnu si aṅa si Fero, Nwa ndi mara ihe ka m'bu, nwa ndi-eze nke mb͕e ochie? 12 Òle ebe ha nọ kwa, bú ndi-gi ndi mara ihe? biko, ka ha gosi kwa gi; ka ha mara kwa ihe Jehova nke usu nile nke ndi-agha zubeworo bayere Ijipt. 13 Ndi-isi Zoan aghọwo ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha, arafuwo ndi-isi Nof; ha edufuwo Ijipt, bú ndi ahu nke bu nkume nkuku nke ebo-ya nile. 14 Jehova agwakọtawo mọ nke nb͕agọ n'etiti ya: ha we dufue Ijipt n'ọlu-ya nile ọ bula, dika onye ṅubigaworo manya ókè si akpafu n'ihe ọ b͕ọrọ. 15 Ọ dighi kwa ọlu ọ bula Ijipt gēnwe, nke isi ma-ọbu ọdudù, ma-ọbu igu-nkwu ma-ọbu amì, gālu. 16 N'ubọchi ahu Ijipt gādi ka ndinyom: ọ gāma kwa jijiji tu kwa egwu n'ihi nfeghari aka nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nke Ya onwe-ya nēfeghari n'elu ya. 17 Ala Juda gāghọ-kwa-ra Ijipt anya-ajù, onye ọ bula nke anēhotara ya Ijipt gātu oké egwu, n'ihi nzube nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nke Ya onwe-ya nēzube megide ya. 18 N'ubọchi ahu obodo ise gādi n'ala Ijipt ndi nāsu asusu Kenean, ndi nāṅuru Jehova nke usu nile nke ndi-agha iyi; Obodo nkwada ka agākpọ otù nime ha. 19 N'ubọchi ahu ebe-ichu-àjà gādiri Jehova n'etiti ala Ijipt, otù ogidi n'akuku ókè-ala-ya gādi-kwa-ra Jehova. 20 Ọ gābu-kwa-ra Jehova nke usu nile nke ndi-agha ihe-iriba-ama na ihe-àmà n'ala Ijipt: n'ihi na ha gētiku Jehova n'ihi ndi-nmeb͕u, O gēzite-kwa-ra ha onye-nzọputa na onye gāluru ha ọ̀gù, O we naputa ha. 21 Jehova gēme kwa ka Ijipt mara Ya, ndi Ijipt ewe mara Jehova n'ubọchi ahu; ha gēji kwa àjà na onyinye-inata-iru-ọma fè Ya, ha gēkwe kwa Jehova nkwa, kwughachi kwa ya. 22 Jehova gēti kwa Ijipt ihe, nēti, nāgwọ kwa; ha gālaghachikute kwa Jehova, O we kwe ka ha riọta ihe ha nāriọ, Ọ gēme kwa ka aru di ha nma. 23 N'ubọchi ahu uzọ atuliri atuli gādi site n'Ijipt we rue Asiria, Asiria ewe ba n'Ijipt, Ijipt gābà kwa n'Asiria: ndi Ijipt gēsoro ndi Asiria fè òfùfè. 24 N'ubọchi ahu ka Israel gēme Ijipt na Asiria atọ, ọ gābu ngọzi n'etiti uwa: 25 n'ihi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha agọziwo ya, si, Onye agọziri agọzi ka ọ bu, bú Ijipt nke ndim, na Asiria nke bu ọlu akam abua, na Israel nke bu ihe-nketam.

Aisaia 20

1 N'arọ Tatan biaruru Ashdod, mb͕e Sagon, bú eze Asiria, zitere ya, o we buso Ashdod agha, were ya; 2 na mb͕e ahu Jehova kwuru okwu site n'aka Aisaia nwa Emoz, si, Je, tọpu ákwà-nkpe n'úkwù-gi, yipu kwa akpukpọ-ukwu-gi n'ukwu-gi. O we me otú a, b͕ara ọtọ nējeghari n'ukwu efu. 3 Jehova we si, Dika orùm, bú Aisaia, si b͕ara ọtọ nējeghari n'ukwu efu arọ atọ ibu ihe-iriba-ama na ihe-ebube megide Ijipt megide kwa Etiopia; 4 otú a ka eze Asiria gēdulaga ndi Ijipt adọtara n'agha, na ndi Etiopia emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ma umu ntà ma ndi-okenye, b͕ara ọtọ na ukwu efu, b͕a kwa ọtọ n'otule, ib͕aba Ijipt ọtọ. 5 Ha ewe tua ujọ, ihere gēme kwa ha, n'ihi Etiopia, bú ihe-ntukwasi-obi-ha, na n'ihi Ijipt, bú ima-nma-ha. 6 Onye bi n'akuku oké osimiri nka gāsi kwa n'ubọchi ahu, Le, otú a ka ihe-ntukwasi-obi-ayi di, ebe ayi b͕alagaworo ka ewe yere ayi aka inaputa ayi n'aka eze Asiria: òle ebe kwa ka ayi onwe-ayi gēwepuga onwe-ayi?

Aisaia 21

1 Ibu eboro ọzara nke oké osimiri. Dika oké ifufe nke di nime Negeb nēfebiga, n'ọzara ka o siworo bia, site n'ala di egwu. 2 Ọhù siri ike ka egosiworom; onye-nghọb͕u nāghọb͕u, onye nāpunara madu ihe nāpunara madu ihe. Rigo, gi Ilam; nọchigide n'agha, gi Midia; ize-ume-ya nile ka M'meworo ka ọ kwusi. 3 N'ihi nka ka úkwùm juputara na nb͕ali; aru-ufu ka m'nwezuru, dika aru-ufu nile nke nwayi ime nēme: ab͕agọrọm ab͕agọ, m'we ghara inu ihe; amaram jijiji, m'we ghara ihu uzọ. 4 Obim akpafuwo, oké ọma-jijiji emewo ka m'tua egwu nke-uku: chi-ojiji nke dim ezi nma ka o meworo ka ọ ghọrọm ima-jijiji. 5 Ha nēdozi table, che nche, rie ihe, ṅua ihe-ọṅuṅu: bilienu, ndi-isi, tenu ọta manu. 6 N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi siworom, Je, guzo onye-nche: ihe ọ gāhu ka ọ gēgosi: 7 ma ọ buru na ọ hu usu madu, ndi-inyinya nēje abua abua, usu inyinya-ibu, usu camel, ọ gāṅa nti nāṅasi nti ike nke-uku. 8 O we kpọ dika ọdum: si, Onye-nwe-ayi, n'elu ulo-nche ka mu onwem nēguzo mb͕e nile n'ehihie, na nchem ka anēme ka mu onwem guzo n'abali nile: 9 ma, le, ub͕u a ka usu madu nābia, ndi-inyinya nēje abua abua. O we za, si, Ọ dawo, Babilon adawo; ọzọ, arusi nile apiri api nke chi-ya nile ka etipiaruworo ala. 10 Gi ihe-nzọcham, na nwa nke ebe-nzọcha-ọkam: ihe m'nuworo n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, ka m'gosiworo unu. 11 Ibu eboro Duma. Mu ka otù onye nākpọ òkù site na Sia, si, Onye-nche, #mb͕e ole gabigaworo n'abali? Onye-nche, #mb͕e ole gabigaworo n'abali? 12 Onye-nche siri, Ututu abiawo, ma abali abiawo kwa: ọ buru na unu gāju ase, juanu ase: laghachinu, bia. 13 Ibu ebero Arebia. N'oké ọhia di n'Arebia ka unu gānọ ọnọdu-abali, unu usu-ije nile nke ndi Dedan. 14 Izute onye akpiri nākpọ nku kutanu miri; unu ndi bi n'ala Tima, werenu nri kwesiri ya zute onye nāwaghari. 15 N'ihi na n'iru ọtutu mma-agha ka ha siri wagharia, n'iru mma-agha amiputara amiputa, na n'iru uta azọrọ ukwu ikwe ya, na n'iru ibu di arọ́ agha bu. 16 N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi siworom, Tutu otù arọ agwu, dika arọ onye egoro ọlu si di, nsọpuru nile nke Kida gāgwusi: 17 ndi fọduru n'ọnu-ọgugu ndi-uta, bú ndi-dike nke umu Kida, ewe di ole-na-ole: n'ihi na Jehova, bú Chineke nke Israel, ekwuwo ya.

Aisaia 22

1 Ibu eboro ndagwurugwu nke ọhù. Ọ bu kwa gini nēme gi, na i rigoworo n'elu ulo nile, ka i ra? 2 Gi nke juputara na nbib͕ọ, obodo nke nātu ùzù, obodo nāṅuri ọṅu-agha; ndi-gi eb͕uru eb͕u abughi ndi eji mma-agha b͕ue, ha abughi kwa ndi nwuru anwu n'agha. 3 Ndi-ọchi-agha-gi nile ab͕apuwo n'otù, ekere ha ab͕u n'enweghi uta: ndi-gi nile achọtaworo, ekere ha ab͕u n'otù, rue ebe di anya ka ha b͕alagara. 4 N'ihi nka ka m'siri, Lepunum anya, m'gākwakpọ anya; unu adọgbula onwe-unu ikasim obi, n'ihi nbibi ada nke ndim. 5 N'ihi na otù ubọchi nke ọb͕ub͕a-aghara, na nke nzọda, na nke ib͕a madu ghari, ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nwere, nime ndagwurugwu nke ọhù; ngwuda nke mb͕idi, na ntiku anētiku ugwu. 6 Ilam bu-kwa-ra àkpà-àkú, ya na usu madu, bú ndi-inyinya; Kia kpughepu-kwa-ra ọta. 7 O rue, na ndagwurugwu-gi nile arọputara arọputa juputara n'ub͕ọ-ala, ndi-inyinya do-kwa-ra onwe-ha n'usoro n'iru ọnu-uzọ-ama. 8 O we kpughepu ihe-nkwuchi nke Juda; i we legide ihe-agha di n'ulo oké ọhia anya n'ubọchi ahu. 9 Nb͕awa nile nke obodo Devid ka unu hu-kwa-ra, na ha di ọtutu: unu wukọba-kwa-ra miri nke ọdọ-miri di n'okpuru. 10 Ọ bu kwa ulo nile nke Jerusalem ka unu guru ọnu, unu we kwatue ulo nile ilusi mb͕idi ike. 11 Ebe-nchikọta-miri ka unu me-kwa-ra n'etiti mb͕idi-unu abua inagide miri nke ọdọ-miri ochie: ma unu elegideghi Onye nēme nka anya, ọ bu kwa Onye nākpu ya-ri site n'ebe di anya ka unu nēlekwasighi anya. 12 Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, we kpọsa ikwa ákwá, na iti aka n'obi n'újú, na ime isi-nkwọcha, na ike ákwà-nkpe n'úkwù n'ubọchi ahu: 13 ma, le, obi-utọ na ọṅù, ob͕ub͕u ìgwè ehi na ob͕ub͕u ìgwè ewu na aturu, oriri anu na ọṅuṅu manya-vine: ka ayi rie ṅu kwa, n'ihi na echi ka ayi gānwu. 14 Jehova nke usu nile nke ndi-agha we kpughepu Onwe-ya na ntim abua, si, N'ezie agaghi-ekpuchiri unu ajọ omume a rue mb͕e unu gānwu, ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, siri. 15 Otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, siri, Je, bakuru odozi-àkù a, bú Shebna, nke bu onye-isi ulo, si, 16 Gini ka i nwere n'ebe a? ma-ọbu ònye ka i nwere n'ebe a, na i gwuwaworo ílì nye onwe-gi n'ebe a? ọ nēgwuwa ílì-ya n'elu, ọ nākàra onwe-ya ebe-obibi nime nkume di elu! 17 Le, Jehova gaje itudasi gi ike, gi nwoke; e, Ọ gaje ipiakọta gi apiakọta. 18 Ọ gāfukọtasi gi ike dika ihe-ọtutú tua gi n'ala sara mbara n'aka abua; n'ebe ahu ka i gānwu, ọ bu kwa n'ebe ahu ka ub͕ọ-ala nile nke nsọpuru-gi gādi, gi ihe-nlelì nke ulo onye-nwe-gi! 19 M'gākwapu kwa gi n'ebe-nguzo-gi siri ike, o gēsi kwa n'ọnọdu-gi dọda gi. 20 Ọ gēru kwa n'ubọchi ahu, na M'gākpọ orùm. bú Elaiakim nwa Hilkaia: 21 M'gēyikwasi ya uwe-gi, were ihe ahu anēke gi n'úkwù kesie ya ike, ọ bu kwa ọchichi-gi ka M'gēnye ya n'aka: ọ gāghọ-kwa-ra ndi bi na Jerusalem na ndi ulo Juda nna. 22 M'gātukwasi kwa nkpisi-ugodi ulo Devid n'ubu-ya; o we meghe, ọ dighi kwa onye nēmechi; o we mechie, ọ dighi kwa onye nēmeghe. 23 M'gākpọgide kwa ya dika ǹtú n'ebe kwesiri ntukwasi-obi; ọ gāghọ-kwa-ra ulo nna-ya oche-eze nsọpuru. 24 Ha gēkokwasi kwa ya nsọpuru nile nke ulo nna-ya, umu-ya na umu-nna-ya, ihe nile nke di ntà, site n'ihe nile bu ọkwa we rue ihe nile bu karama. 25 N'ubọchi ahu (ọ bu ihe si n'ọnu nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta) ka ǹtú nke akpọgideworo n'ebe kwesiri ntukwasi-obi gāpu n'ọnọdu-ya; ewe b͕utue ya, o we da, ewe bipu ibu di n'elu ya; n'ihi na Jehova ekwuwo ya.

Aisaia 23

1 Ibu eboro Taia. Kwasienu ákwá ike, unu ub͕ọ nke Tashish; n'ihi na ebibiwo ya, ulo we ghara idi ya, uzọ-nbata ghara kwa idi ya: esiwo n'ala Kitim kpughere ha ya. 2 Derenu du, unu ndi bi n'ala di oké osimiri buruburu; gi onye ndi-ahia Zaidon, bú ndi nāgabiga oké osimiri, mejuworo ihe. 3 N'elu ọtutu miri ka nkpuru-ọghigha Shaihoa, nke bu owuwe-ihe-ubi nke Nail, bu ihe-omume-ya; o we ghọ urù-ahia nke mba di iche iche. 4 Ka ihere me gi, Zaidon: n'ihi na oké osimiri ekwuwo, bú ebe siri ike nke oké osimiri, si, Ime emeghm, amuputakwaghm nwa, emekwaghm ka umu-okorọbia toputa, emekwaghm ka umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke tozue okè. 5 Mb͕e anuru ihe a n'Ijipt, ihe anuru bayere Taia gēme ka ha b͕alie. 6 Gabiganu rue Tashish; kwasienu ákwá ike, unu ndi bi n'ala di oké osimiri buruburu. 7 Ọ̀ bu nka ka anēme unu, gi obodo nāṅuri ọṅu, nke mb͕e gara aga ya sitere n'ubọchi nile nke mb͕e ochie, onye ukwu-ya abua nēdu ya-ri je n'ebe di anya inọ dika ọbìa? 8 Ònye zubeworo nka megide Taia, bú obodo nke nēkpube ndi ọzọ okpu-eze, nke ndi-ahia-ya bu ndi-isi, nke ndi-ọzu-ahia-ya bu ndi-nsọpuru nke uwa? 9 Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezubewo ya, ime ka npako nke ima-nma nile ghara idi nsọ, ime ka elelìa ndi-nsọpuru nile nke uwa. 10 Rùbiga n'etiti ala-gi dika Nail, gi ada Tashish; ihe-ike-n'úkwù adighi kwa ọzọ. 11 Aka-Ya ka O setiworo n'elu oké osimiri, O mewo ka ala-eze di iche iche ma jijiji: Jehova enyewo iwu bayere Kenean, ikpochapu ebe siri ike ya nile. 12 O we si, I gaghi-aṅuri kwa Ọṅu-agha ọzọ, gi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke nke anēmeb͕u, bú ada Zaidon: bilie, gabiga rue Kitim; ọbuná n'ebe ahu ọ dighi izu-ike i gēnwe. 13 Le, ala ndi Kaldea; ndi nka adighi; Asiria edoziworo ya anu-ọhia nile nke biri n'ala kpọrọ nku: ha mere ka ulo-nche-ya nile guzosie ike, ha tikpọrọ ulo-elu-ya nile; o mere ya ka ọ ghọ ebe dara ada. 14 Kwasienu ákwá ike, unu ub͕ọ nke Tashish: n'ihi na ebibiwo ebe siri ike unu. 15 Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na agēchezọ Taia ọgu arọ atọ na iri, dika ubọchi nile nke otù eze si di: mb͕e ọgu arọ atọ na iri ahu gwusiri ọ gādiri Taia dika abù nwanyi nākwa iko. 16 Were ubọ-akwara, jegharia n'obodo buruburu, gi nwanyi nākwa iko nke echezọrọ echezọ; kpọ ya nke-ọma, bùa ọtutu abù, ka ewe cheta gi. 17 Ọ gēru kwa, mb͕e ọgu arọ atọ na iri gwusiri, na Jehova gēleta Taia, o we lata n'onyinye-ikwa-iko-ya, ya na ala-eze nile nke uwa nke di n'elu uwa ewe kwa iko. 18 Urù-ahia-ya na onyinye-ikwa-iko-ya gāghọ kwa ihe nsọ Jehova nwere: agaghi-edebe ya n'ulo-àkù, agaghi-ebukọba kwa ya; n'ihi na ndi bi n'iru Jehova gēnwe urù-ahia-ya, iriju afọ, na inwe ákwà-nb͕okwasi nādigide adigide.

Aisaia 24

1 Le, Jehova nāb͕aba uwa ọtọ, Ọ nēme kwa ka ọ tọb͕ọrọ n'efu, Ọ nēkpùta kwa ya iru, me ka ndi bi nime ya b͕asa. 2 O gēru kwa, na ka o si diri ndi ọ bula, otú a ka ọ gādiri onye-nchu-àjà; dika o si diri orù, otú a ka ọ gādiri onye-nwe-ya; dika o si diri nwanyi nēje ozi, otú a ka ọ gādiri nwanyi-nwe-ya; dika o si diri onye nēgo ego, otú a ka ọ gādiri onye nēre ere; dika o si diri onye-nbinye, otú a ka ọ gādiri onye-nbite; dika o si diri onye nānara uma, otú a ka ọ gādiri onye nēnye ya uma. 3 Agāb͕abasi uwa ọtọ, lutasia ya n'agha; n'ihi na Jehova ekwuwo okwu a. 4 Uwa eruwo újú kpọnwua, elu-uwa dum madu bi atalatawo kpọnwu kwa, ndi di elu nke ndi uwa atalatawo. 5 Emeruwo kwa uwa n'okpuru ndi bi ya; n'ihi na ha agabigawo iwu nile, b͕anwe ukpuru, mebie ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi. 6 N'ihi nka ka ọb͕ub͕a-iyi ripiaworo uwa, ewe ma ndi bi nime ya ikpe: n'ihi nka ka ndi bi n'uwa reworo ọku, madu ole-na-ole we fọdu. 7 Manya-vine ọhu eruwo újú, osisi vine atalatawo, ndi nile nke nāṅuri ọṅu n'obi ezewo ume. 8 Obi-utọ nke egwú-otiti nile akwusiwo, nkpọtu nke ndi nāṅuri ọṅu-agha agwuwo obi-utọ nke ubọ-akwara akwusiwo. 9 Ha agaghi-eji abù ṅu manya-vine; ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya gādi ndi nāṅu ya ilu. 10 Etipiawo obodo nke ihe tọb͕ọrọ n'efu: emechiwo ulo nile ọ bula, ka madu we ghara ibata. 11 Iti-nkpu di n'èzí nile n'ihi manya-vine ahu; ọṅù nile ab͕achiwo, emewo ka obi-utọ nke uwa je biri n'ala ọzọ. 12 Nke fọduru n'obodo bu ebe tọb͕ọrọ n'efu, ọ bu kwa ntikpọ ka eji tie ọnu-uzọ-ama. 13 N'ihi na otú a ka ọ gādi n'etiti uwa n'etiti ndi nile, dika ntisisi nke osisi olive, dika nkpuru nke fọduru itutukọ, mb͕e ọghughọ-nkpuru-vine gwusiworo. 14 Ndi ahu gēbuli olu-ha, ha gēti nkpu ọṅù; n'ihi nbili-elu Jehova ha gēsi n'oké osimiri tisie nkpu ike. 15 N'ihi nka sọpurunu Jehova n'ala ìhè nile, sọpurunu aha Jehova, bú Chineke Israel, n'ala nile nke di oké osimiri buruburu. 16 Site na nsọtu uwa ka ayi nuworo abù ọma di iche iche, ima-nma diri onye ezi omume. M'we si, Ọtita-aru dirim, ọtita-aru dirim, ahuhu dirim! ndi-nghọb͕u aghọb͕uwo; e, ihe-nghọb͕u ka ndi-nghọb͕u jiworo ighọb͕u. 17 Oké egwu na olùlù na ib͕udu nādikwasi gi, gi onye bi n'uwa. 18 Ọ gēru kwa, na onye ahu nke nāb͕anari olu oké egwu ahu gādabà n'olùlù ahu; ọzọ, onye ahu nke nārigoputa n'etiti olùlù ahu, agējide ya n'ib͕udu ahu: n'ihi na window nile nke di n'elu ka emegheworo, ntọ-ala nile nke uwa ewe me nkpatu. 19 Anyajisiwo uwa, emebisiwo uwa, ewezugasiwo uwa n'ọnọdu-ya. 20 Uwa gāṅaghari nke-uku dika onye ṅubigaworo manya ókè, ọ gādaghari dika ulo-ọnọdu-abali; njehie-ya gādi kwa arọ́ n'aru ya, o we da, ghara ibili kwa ọzọ. 21 Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na Jehova gēwere nmehie nke usu-ndi-agha nke ebe di elu leta ha n'ebe di elu, Ọ gēwere kwa nmehie nke ndi-eze nke uwa leta ha n'elu uwa. 22 Ewe chikọta ha, dika esi achikọta ndi-nkpọrọ n'olùlù, agēmechibido kwa ha n'ulo-nkpọrọ, mb͕e ubọchi gasiri agēleta ha. 23 Ọnwa gēnwe kwa iru-ihere, ihere gēme kwa anyanwu; n'ihi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha aghọwo eze n'ugwu Zaion, na nime Jerusalem, ọ bu kwa n'iru ndi-okenye-Ya ka nsọpuru gādi.

Aisaia 25

1 Jehova, Chinekem ka I bu; m'gēme ka I di elu, m'gēkele aha-Gi; n'ihi na I mewo ihe-ebube, bú ndum-ọdu di iche iche site na mb͕e di anya gara aga, n'ikwesi-ntukwasi-obi na ezi-okwu. 2 N'ihi na I mewo ka obodo ghọ obo-ihe; I mewo ka obodo ewusiri ike ghọ ebe dara ada: I mewo ka ulo-elu nke ndi ala ọzọ ghara ibu obodo; rue mb͕e ebighi-ebi agaghi-ewu ya. 3 N'ihi nka ka ndi di ike gāsọpuru Gi, obodo nke ndi-mba ndi nēme ka madu ma jijiji gātu egwu Gi. 4 N'ihi na I buworo onye nēnweghi ike ebe siri ike, I buworo ob͕eye ebe siri ike nime nkpà nākpa ya, ebe-nb͕abà ipu n'oké miri-ozuzo, ǹdò ipu n'okpom-ọku, mb͕e oké ifufe nke ndi nēme ka madu na jijiji di ka oké miri-ozuzo nāmakwasi mb͕idi. 5 Dika okpom-ọku n'ebe kpọrọ nku, otú a ka I gēme ka nkpọtu nke ndi ala ọzọ darue ala; dika okpom-ọku site na ǹdò nke igwe-oji, otú a ka agēweda abú ọma nke ndi nēme ka madu ma jijiji. 6 Ọ bu kwa n'ugwu a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēmere ndi nile di iche iche oké oriri nke ihe mara abuba, bú oké oriri nke ezi manya-vine doro edo, nke ihe mara abuba juputara n'umi, nke manya-vine doro edo azara nke-ọma. 7 Ọzọ, n'ugwu a ka Ọ gēloda iru ihe-nfuchi ahu eji afuchi ndi nile di iche iche, na ihe-nkpuchi ahu eji ekpuchi mba nile. 8 O lodawo ọnwu rue mb͕e ebighi-ebi; Onye-nwe-ayi Jehova gēhichapu kwa anya-miri n'iru nile; ita-uta nke ndi-Ya ka Ọ gēwezuga kwa n'elu uwa nile: n'ihi na Jehova ekwuwo ya. 9 Agāsi kwa n'ubọchi ahu, Le, Chineke-ayi ka Nka bu; ayi elewo anya Ya, Ọ gāzọputa kwa ayi: Nka bu Jehova; ayi elewo anya Ya, ka ayi tegharia egwú ọṅù ṅuri kwa na nzọputa-Ya. 10 N'ihi na aka Jehova gānọgide n'ugwu a, ewe zọda Moab n'ọnọdu-ya, dika esi azọda okporo-ọka nime miri nke olùlù ikpo ǹsí-anu. 11 Ọ gāb͕asa kwa aka-ya abua n'etiti ya, dika onye nēgwu miri si ab͕asa aka-ya igwu miri: ma Ọ gēme ka npako-ya di ala, ya na ọlu-aghughọ nile nke aka-ya abua. 12 Ọzọ, ebe ewusiri ike nke ulo-elu nke mb͕idi-gi nile ka O budaworo, me ka ọ di ala, me ka ọ darue ala, ọbuná rue ájá.

Aisaia 26

1 N'ubọchi ahu ka agābù abù a n'ala Juda: Obodo siri ike ka ayi nwere; nzọputa ka O gēdo ka ọ buru mb͕idi-ya nile na ékpè-ya. 2 Meghenu ọnu-uzọ-ama nile, ka mba nke nēme ezi omume nke nēdebe ikwesi-ntukwasi-obi nile we ba nime. 3 I nēchebe onye emeworo ka uche-ya dabere na Gi, ọ we nādizu n'udo: n'ihi na ọ bu Gi ka o nātukwasi obi. 4 Tukwasinu obi na Jehova rue mb͕e nile ebighi-ebi: n'ihi na Ja Jehova bu oké nkume nke mb͕e nile ebighi-ebi. 5 N'ihi na O budawo ndi bi n'elu, bú obodo di elu: Ọ nēme ka ọ di ala, Ọ nēme ka ọ di ala ọbuná rue ala: Ọ nēme ka ọ darue ájá. 6 Ukwu gāzọda ya; bú ukwu abua nke onye ewedara n'ala, ha na nzọ-ukwu nke ndi nēnweghi ike. 7 Uzọ onye ezi omume nēso bu izi-ezi nile: Gi onye ziri ezi nēme ka uzọ onye ezi omume di lari. 8 Ọzọ, n'uzọ nke ikpé-Gi nile, Jehova, ka ayi leworo anya Gi: aha-Gi na ncheta-Gi nāti nkpuru-obi-ayi akpiri. 9 Na nkpuru-obim ka akpiri Gi nātim n'abali; e, mọm nke di nimem ka m'gēji chọsie Gi ike: n'ihi na mb͕e ikpé-Gi nile nādakwasi uwa, ezi omume ka ndi bi n'elu-uwa dum madu bi mutaworo. 10 Asi na emere onye nēmebi iwu amara, ọ gaghi-amuta ezi omume; n'ala nke izi-ezi nile ọ gēme ajọ omume, ma ọ gaghi-ahu idi-elu nke Jehova. 11 Jehova, ebuliwo aka-Gi, ma ha adighi-ahu: ha gāhu ekworo I nēkworo ndi-Gi, ihere ewe me ha; ọzọ, ọku nke ndi nēmegide Gi gērichapu ha. 12 Jehova, I gēdoro ayi udo: n'ihi na ọ bu kwa ọlu nile nke ayi ka I luworo ayi. 13 Jehova, Chineke-ayi, ndi nwenu ọzọ enwewo ayi, ọ bughi nání Gi; ma ọ bu nání site na Gi ka ayi gēhota aha-Gi. 14 Ndi nwuru anwu adighi-adi ndu; ndi nādighi ndu adighi-ebili: n'ihi nka ka I letaworo ha we kpochapu ha, me ka ncheta nile nke diri ha la n'iyì. 15 I tukwasiwo madu na mba nka, Jehova, I tukwasiwo madu na mba nka; I natawo nsọpuru: I mewo ka nsọtu nile nke ala di anya. 16 Jehova, n'ahuhu ka ha letaworo Gi, ha takwuru ntakwu n'ekpere nke-uku mb͕e idọ-aka-na-nti-Gi ruru ha aru. 17 Dika nwayi nke di ime, nke gaje imu nwa, si ab͕ali nb͕ali, tie nkpu n'aru-ufu-ya nile; otú a ka ayi diworo n'iru Gi, Jehova. 18 Ayi adiwo ime, ayi ab͕aliwo nb͕ali, ayi amuwo dika agāsi na ọ bu ifufe; ọ bughi ebe nzọputa ka ayi nēme ala; adighi-amuputa kwa ndi ganēbi n'elu-uwa dum madu bi. 19 Ndi-Gi ndi nwuru anwu gādi ndu; ozum nile gēbili. Tetanu, tie nkpu ọṅù, unu ndi bi n'ájá: n'ihi na igirigi nke ìhè nile ka igirigi-Gi bu, ala gāmuputa kwa ndi nādighi ndu. 20 Bia, ndim, bata n'ime-ulo-gí nile, mechibido uzọ-gi nile n'azu-gi: zobe onwe-gi nání otù ntabi-anya ntà, rue mb͕e oké iwe gāgabiga. 21 N'ihi na, le, Jehova nēsi n'ọnọdu-Ya aputa iji ajọ omume nke ndi bi n'uwa leta ha: ọzọ, ala gēkpughe ọbara-ya, ọ gaghi-ekpuchi kwa ndi-ya eb͕uru eb͕u ọzọ.

Aisaia 27

1 N'ubọchi ahu Jehova gēwere mma-agha-Ya di arọ́ di uku di ike ji nmehie-ha leta leviathan, bú agwọ nāb͕a ọsọ, na leviathan, bú agwọ b͕agọrọ ab͕agọ; Ọ gēb͕u kwa ogologo anu ahu nke di n'oké osimiri. 2 N'ubọchi ahu: Otù ubi-vine nke manya-vine nāsu ufufu, tienu nkpu ọṅù bayere ya. 3 Mu onwem, Jehova, bu onye-nche-ya; na mb͕e nile ọ bula dikasiri ntà ka M'nēdè ya miri: ka onye ọ bula we ghara iji ihe ọjọ leta ya, abali na ehihie ka M'nēche ya. 4 Ọnuma adighi nimem: ọ gādim nọ̄ nma ma ogwu na uke gēmegidem n'agha! M'gāwaku ha, M'gēsurekọta ha n'otù. 5 Ma-ọbu, ya jide ebem siri ike, ọ gēme ka Mu na ya di n'udo; e, ọ gēme ka Mu na ya di n'udo. 6 N'ọdi-n'iru Jekob gāb͕a nkpọrọgwu: Israel gāb͕awa okoko dika osisi, ma ifuru: ha we mejue iru elu-uwa dum madu bi n'ihe-omume. 7 Ọ̀ bu dika ntib͕u nke onye nētib͕u ya-ri ka O tib͕uworo ya? ma ọ̀ bu dika ob͕ub͕u nke ndi o nēb͕uri ka eb͕uworo ya? 8 N'ọtùtù, mb͕e I nēzilaga ya, ka Gi na ya nēse okwu: O jiwo ifufe-Ya siri ike wepu ya n'ubọchi ifufe Iru-anyanwu. 9 N'ihi nka agēwere nka kpuchie ajọ omume Jekob, nka bu kwa nkpuru nile nke iwezuga nmehie-ya: mb͕e O ji eme nkume nile nke ebe-ichu-àjà ka ha di ka nkume nzu etipiara etipia, Asherim na arusi-anyanwu nile agaghi-ebili ọzọ. 10 N'ihi na obodo ewusiri ike nọ nání ya, ebe-obibi ajuru aju na nke arapuru arapu, dika ọzara: n'ebe ahu ka nwa-ehi gāta nri, ọ bu kwa n'ebe ahu ka ọ gāmakpu, richapu alaka-ya nile. 11 Mb͕e ngalaba-ya kpọnwuru akpọnwu, agānyajipu ha; ndinyom abia sure ha ọku: n'ihi na ọ bughi ndi nwere nghọta ka ọ bu; n'ihi nka Onye meworo ya agaghi-enwe obi-ebere n'aru ya, Onye kpuworo ya agaghi-emere ya amara. 12 Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na Jehova gētichapu nkpuru-ọka-Ya, site na miri nērù ọku ọku nke Osimiri rue miri-iyi Ijipt, ewe chikọta unu onwe-unu n'otù n'otù, unu umu Israel. 13 Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na agāfù opì-ike uku; ha gābia kwa, bú ndi nāla n'iyì n'ala Asiria, na ndi achusara achusa n'ala Ijipt; ha gākpọkwa isi ala nye Jehova n'ugwu nsọ ahu nime Jerusalem.

Aisaia 28

1 Ahuhu gādiri okpu-eze npako nke ndi Efraim nāṅubiga manya ókè, ahuhu gādi-kwa-ra okoko-ọhia nākpọnwu akpọnwu nke ima-nma-ya mara nma, nke di n'isi nke ndagwurugwu di urù nke ndi manya-vine nēb͕u! 2 Le, otù onye di ike nke nwere ume ka Onye-nwe-ayi nwere; dika oké miri-ozuzo nke ákú-miri-ígwé, dika oké ifufe nke nēfechapu efechapu, dika oké miri-ozuzo nke miri di ike nērubiga ókè, otú a ka o jiworo ihe-ike tọb͕o ihe n'ala. 3 N'okpuru ukwu ka agāzọda okpu-eze npako nke ndi Efraim nāṅubiga manya ókè: 4 okoko-ọhia nke nākpọnwu akpọnwu nke ima-nma-ya mara nma, nke di n'isi nke ndagwurugwu di urù, gādi kwa ka nkpuru-fig buru uzọ cha tutu mb͕e okpom-ọku erue; nke mb͕e onye ọ bula nke nāhu ya anya nāhu, mb͕e ọ nādi n'ọbu-aka-ya o lo ya. 5 N'ubọchi ahu Jehova nke usu nile nke ndi-agha gāghọrọ ndi-Ya fọduru okpu-eze nke mara nma, na okpu ọma nke ima-nma: 6 Ọ gāghọ-kwa-ra onye nānọkwasi n'oche ikpé mọ nke ikpé, Ọ gāghọ-kwa-ra ndi nāchughachi ndi nēbu agha rue ọnu-uzọ-ama idi-ike. 7 Ma ọbuná ndia adaghariwo site na manya-vine, ọ bu kwa site n'ihe-ọṅuṅu nābà n'anya ka ha ṅaghariworo; onye-nchu-àjà na onye-amuma adaghariwo site n'ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, manya-vine elodawo ha, ha aṅaghariwo site n'ihe-ọṅuṅu nābà n'anya; ha adaghariwo n'ọhuhu, ha asuwo ngọngọ n'ihe nile ekpere n'ikpe. 8 N'ihi na table nile juputara n'ihe-ọb͕ub͕ọ ruru inyi, ọ dighi ebe di ọcha. 9 Ònye ka ọ gēzí ihe-ọmuma? ọ̀ bu kwa onye ka ọ gēme ka ọ ghọta ihe anuru? ọ̀ bu ndi emeworo ka ha rapu iṅu miri-ara, ndi anapuru ara? 10 N'ihi na ọ bu ihe enyere n'iwu tukwasi ihe enyere n'iwu, ihe enyere n'iwu tukwasi ihe enyere n'iwu; usoro tukwasi usoro, usoro tukwasi usoro; nwantī n'ebe a, nwantī n'ebe ahu. 11 N'ezie site n'isu-nsu nke eb͕ub͕ere-ọnu na site n'ire di iche ka Ọ gāgwa ndi nka okwu: 12 bú Onye siri ha, Nka bu izu-ike ahu, menu ka onye ike gwuru zuru ike; nka bu kwa igba ume ahu: ma ha ekweghi inu. 13 Okwu Jehova gābu-kwa-ra ha ihe enyere n'iwu tukwasi ihe enyere n'iwu, ihe enyere n'iwu tukwasi ihe enyere n'iwu; usoro tukwasi usoro, usoro tukwasi usoro; nwantī ebe a, nwantī ebe ahu; ka ha we je, su ngọngọ da n'azu, ewe tijie ha, ha ama n'ọnyà, ejide ha. 14 N'ihi nka nurunu okwu Jehova, unu ndi nākwa emò, ndi nāchi ndi nka bi na Jerusalem: 15 N'ihi na unu asiwo, Ayi na ọnwu ab͕awo ndu, ayi na ala-mọ ekweritawo kwa nkwa; mb͕e utari nke nērubiga ókè dika miri gāgabiga, ọ gaghi-abiakute ayi; n'ihi na ayi emewo ka okwu-ugha buru ebe-nb͕abà-ayi, ọ bu kwa n'okwu-ugha ka ayi zobeworo onwe-ayi: 16 n'ihi nka otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova, siri, Le, abum onye tọworo ntọ-ala na Zaion, bú otù nkume, nkume nke ọnwunwa, nkume-nkuku di oké ọnu-ahia nke bu ntọ-ala siri ike: onye nēkwere agaghi-ewere ọsọsọ b͕alaga. 17 M'gēme kwa ka ikpé buru eriri, me kwa ka ezi omume buru ihe-ọtùtù: ákú-miri-ígwé ewe kpochapu ebe-nb͕abà nke okwu-agha, miri gēruchapu kwa ebe-nzuzo. 18 Agēhichapu kwa ọb͕ub͕a-ndu unu na ọnwu b͕ara, nkwa unu na ala-mọ kweritara agaghi-eguzosi kwa ike; mb͕e utari nke nērubiga ókè dika miri gāgabiga, unu gāghọ-kwa-ra ya ebe-nzọda. 19 Mb͕e ọ bula ọ nāgabiga ọ gējide unu; n'ihi na kwa-ututu ka ọ gāgabiga, n'ehihie na n'abali: o we buru nání ọma-jijiji ighọta ihe anuru. 20 N'ihi na ihe-ndina di nkpunkpu kari nke madu gēsetipusi onwe-ya n'elu ya; ákwà-nkpuchi di kwa warara kari nke madu gāfuchi onwe-ya. 21 N'ihi na dika n'ugwu Perazim, otú a ka Jehova gēbili; dika na ndagwurugwu Gibeon, otú a ka Ọ gēwe oké iwe; ilu ọlu-Ya - nke onye ala ọzọ ka ọlu-Ya bu; na ifè òfùfè-Ya - nke onye ala ọzọ ka òfùfè-Ya bu. 22 Ma ub͕u a, unu aghọla ndi nākwa emò, ka ab͕u-unu we ghara isi ike: n'ihi na ngwusi, nke aka-kwa-ra àkà, ka m'nuworo n'ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, n'elu uwa nile. 23 Genu nti, nu kwa olum; ṅanu nti, nu kwa okwu-ọnum. 24 Ọ̀ bu ubọchi nile ka onye-plough nēgwu ala igha nkpuru? ọ̀ bu ubọchi nile ka ọ nēgwughe nēme ka ala-ubi-ya di lari? 25 Ọ buru na o mewo ka iru-ya di lari, ọ̀ dighi-aghasa fitch, gha cummin, kua ọka wheat n'ahiri, gha ọka barley n'ebe akara àkà, gha ọka spelt n'ókè-ala-ya? 26 N'ihi na Chineke-ya nādọ ya aka na nti iluzi aluzi, O nēzí ya ihe. 27 N'ihi na ejighi ihe di nkọ zọcha fitch, adigh-akpore kwa wheel nke ub͕ọ-ala buruburu n'elu cummin; kama ọ bu nkpa-n'aka ka eji ticha fitch, ọ bu kwa ndele ka eji ticha cummin. 28 Ànāsupia ọka eji eme achicha? é-è, n'ihi na ọ bughi rue mb͕e ebighi-ebi ka ọ ganāzọchasi ya ike, me ka wheel nke ub͕ọ-ala-ya na inyinya-ya nile gagharia n'elu-ya; ọ dighi-asupia ya. 29 Nka site-kwa-ra n'aka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, O mewo ka ndum-ọdu di ebube, O mewo ka nzube-ihe di uku.

Aisaia 29

1 Ahuhu gādiri Eriel, Eriel, bú obodo ebe Devid mara ulo-ikwū-ya! Tukwasinu arọ n'arọ; ka ememe nile b͕agharute na mb͕e-ha: 2 M'gākpab͕u kwa Eriel, ize-ume na isu-ude gādi kwa: o we dirim ka Eriel. 3 M'gāma kwa ulo-ikwūm buruburu megide gi, were ulo-agha nọchigide gi, wulie ihe-nnọchigide-n'agha imegide gi. 4 Ewe me ka i di ala, site n'ala ka i gēkwu, ọ bu kwa n'ájá ka okwu-ọnu-gi gēsi puta, di ala; olu-gi gādi kwa ka onye nāju mọ ihe, ọ gēsi n'ala puta, okwu-ọnu-gi gēsi kwa n'ájá be ka umu-nnunu. 5 Ma ìgwè ndi ala ọzọ nēmegide gi gādi ka ájá di ntà, ìgwè ndi nēme ka madu ma jijiji gādi kwa ka ib͕ob͕o-ọka nke nāgabiga agabiga: ọ gādi kwa n'otù ntabi-anya na mberede. 6 Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēji éb͕è-elu-igwe, ji kwa ala-ọma-jijiji, na oké olu, na oké ifufe na ikuku uku, na ire-ọku nke -ọku nērichapu erichapu, leta ya. 7 Dika nrọ, bú ọhù nke abali, otú a ka ha gādi kwa, bú ìgwè mba nile ndi nēbuso Eriel agha, bú ndi nile nēbuso ya na ebe-ya ewusiri ike agha, nākpab͕u kwa ya. 8 Ọ gādi kwa ka mb͕e onye agu nāgu nārọ nrọ, ma, le, ọ nēri ihe; o we teta, ma nkpuru-obi-ya b͕ara aka: ma-ọbu dika mb͕e onye akpiri nākpọ nku nārọ nrọ, ma, le, ọ nāṅu miri; ọ we teta, ma, le, ọ dawo #mbà, nkpuru-obi-ya nāchọsi kwa ihe ike: otú a ka ìgwè mba nile gādi, ndi nēbuso ugwu Zaion agha. 9 Ka ọ b͕agwoju unu anya, ka o ju kwa unu anya; techienu anya-unu, ka etechi kwa anya-unu: ha aṅubigawo manya ókè, ma ọ bughi manya ka ha ṅubigara ókè; ha aṅaghariwo, ma ọ bughi ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya. 10 N'ihi na Jehova awukwasiwo unu mọ nke oké ura, we mechisie anya-unu ike, bú ndi-amuma; isi-unu, bú ndi-ọhù, ka O kpuchiwo-kwa-ra. 11 Ọhù a nile we diri unu ka okwu nke akwukwọ akasiri akàrà ike, nke anēnye onye mara akwukwọ, si, Biko, gua nka: o we si, Apughm, n'ihi na ihe akasiworo akàrà ike ka ọ bu: 12 ewe were akwukwọ ahu nye onye nāmaghi akwukwọ, si, Biko, gua nka: o we si, Amaghm akwukwọ. 13 Onye-nwe-ayi we si, N'ihi na ndi nka abiaruwo nso n'ọnu-ha, were kwa eb͕ub͕ere-ọnu-ha sọpurum, ma ha emewo ka obi-ha di anya n'ebe M'nọ, egwu ha nāturum ewe buru ihe madu nyere n'iwu nke emere ka ha muta: 14 n'ihi nka, le, M'gaje ilu kwa oké ọlu ọzọ n'etiti ndi nka, bú oké ọlu na ọlu ebube: amam-ihe nke ndi-ha mara ihe gāla kwa n'iyì, nghọta nke ndi-nghọta-ha gēzobe kwa onwe-ya. 15 Ahuhu gādiri ndi nēzonari Jehova ndum-ọdu-ha n'ebe di omimi, ndi ọ bu kwa n'ọchichiri ka anālu ọlu nile ha, ha we si, Ònye nāhu ayi? ma-ọbu ònye mara ayi? 16 Le, ka unu si ekpù ihe iru nke-uku! Ọ̀ bu n'urọ ka agāgu ọkpu-ite? na ihe emere eme gēkwu okwu bayere onye meworo ya, si, O meghm; ma-ọbu na ihe akpuru akpu gēkwu okwu bayere onye kpuworo ya, si, Ọ ghọtaghi. 17 Ọ̀ bughi nwa mb͕e ntà fọduru, Lebanon ewe ghọ ubi ọma, agu kwa ubi ọma n'oké ọhia? 18 Ndi nti chiri gānu kwa okwu nile nke akwukwọ n'ubọchi ahu, ọ bu kwa n'oké ọchichiri na n'ọchichiri ka anya ndi-ìsì gēsi hu uzọ. 19 Ndi di ume-ala n'obi gātukwasi kwa ihe n'ọṅù-ha nime Jehova, ndi-obeye n'etiti madu gēteghari kwa egwú ọṅù n'Onye Nsọ nke Israel. 20 N'ihi na onye nēme ka madu ma jijiji nwere ọgwugwu, onye nākwa emò agwusiwo kwa, ebipuwo kwa ndi nile nāmuru ajọ ihe anya: 21 bú ndi nēme ka madu mehie site n'okwu-ha, ndi nēsi-kwa-ra onye nāba nba n'ọnu-uzọ-ama ọnyà, we were ihe tọb͕ọrọ n'efu wezuga onye ezi omume. 22 N'ihi nka ka Jehova, bú Onye b͕aputara Abraham, kwuru okwu bayere ulo Jekob otú a, si, Ihere agaghi-eme Jekob ub͕u a, iru-ya agaghi-ab͕aru kwa ub͕u a. 23 Ma mb͕e ọ nāhu umu-ya, bú ọlu akam abua, n'etiti ya, ha gēdo aham nsọ; e, ha gēdo Onye Nsọ nke Jekob nsọ, ọ bu kwa n'iru Chineke nke Israel ka ha gāma jijiji. 24 Ndi nākpafu na mọ-ha gāma kwa nghọta, ndi-ntamu gāmuta kwa ihe-nmuta.

Aisaia 30

1 Ahuhu gādiri umu nēwezuga onwe-ha, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, ndi nēme ihe ezubeworo, ma o siteghi n'akam; ndi ji ihe-nkpuchi ekpuchi ihe, ma ọ bughi nke Mọm, ka ha we were nmehie tukwasi na nmehie: 2 ndi nēje irida n'Ijipt, ma ha ajughi ase n'ọnum; ib͕alaga ọsọsọ n'ebe siri ike nke Fero, na ib͕abà na ǹdò Ijipt! 3 Ma ebe siri ike nke Fero gāghọrọ unu ihere, nb͕abà na ǹdò Ijipt gāghọ-kwa-ra unu itiye n'ọnọdu-ihere. 4 N'ihi na ndi-isi-ya anọwo na Zoan, ndi-ozi-ya nābiaru Hanes. 5 Ha nile gēme ihere otù ndi nādighi-abara ha urù, ndi nābughi ihe iye aka, nābughi kwa ihe iba urù, kama ha bu ihe-ihere, ọzọ kwa, ha bu ihe-ita-uta. 6 Ibu eboro anumanu nile nke Negeb. N'ala ahuhu na nkpà, ebe nne-ọdum na oke-ọdum na aju-ala na agwọ yiri ọku nēfe efe si abia, ka ha nēbu àkù-ha nile n'ubu umu-inyinya-ibu, na ihe-ha nile di oké ọnu-ahia n'okpu-azu camel, ijekuru otù ndi nāgaghi-abara ha urù. 7 Ma Ijipt, nání otù nku-ume na ihe-efu ka iye-aka-ha bu: n'ihi nka ka M'kpọworo ala nka Rehab, ndi ahu bu nkwusi. 8 Ub͕u a, bata, dekwasi ya na mbadamba íhe n'etiti ha, kà kwa ya n'akwukwọ, ka o we diri ubọchi ọdi-n'iru rue mb͕e nile ebighi-ebi. 9 N'ihi na ndi nke nānupu isi ka ọ bu, umu nēkwu okwu-ugha, umu nēkweghi inu iwu Jehova: 10 ndi siworo ndi-ọhu-uzọ, Unu agaghi-ahu uzọ; ndi siwo-kwa-ra ndi-ọhù, Unu agaghi-ahuru ayi ihe ziri ezi n'ọhù-unu, gwanu ayi okwu ire-utọ nile, hunu ihe-ikwa-emò n'ọhù-unu: 11 Wezuganu onwe-unu n'uzọ, sinu n'okporo-uzọ wezuga onwe-unu, menu ka Onye Nsọ nke Israel kwusi iguzo n'iru ayi. 12 N'ihi nka ka Onye Nsọ nke Israel ji si otú a, N'ihi na unu juru okwu a, tukwasi obi na nmeb͕u na nsihie-uzọ, we nādabere ya; 13 n'ihi nka ajọ omume a gādiri unu ka nb͕awa nāda ada, nke nākwọputa akwọputa na mb͕idi di elu, nke ọ bu na mberede n'otù ntabi-anya ka ntipia-ya nābia. 14 Ọ gētiwa kwa ya dika esi etiwa ite ndi-ọkpu-ite nākpu, nke etipiara etipia, Ọ gaghi-enwe ọmiko: ewe ghara ichọta n'etiti ntipia-ya otù ejùjù iji guru ọku n'okpukpo-ntu, ma-ọbu iji kupu miri n'ọdọ-miri. 15 N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova, bú Onye Nsọ nke Israel, siri, Nime nlata na izu-ike ka agāzọputa unu; n'inọ-jū na n'itukwasi-obi ka idi-ike-unu gādi: ma unu ekweghi. 16 Kama unu siri, É-è, n'ihi na inyinya ka ayi gānọkwasi b͕alaga; n'ihi nka unu gāb͕alaga: unu si-kwa-ra, Anu di ngwa ka ayi gānọkwasi; n'ihi nka ka ndi nāchu unu gādi ngwa. 17 Nnù abua na ọgu iri gēsi n'iru iba-nba nke otù onye b͕alaga; n'iru iba-nba nke madu ise ka unu gēsi b͕alaga: rue mb͕e unu gāfọdu dika otù osisi-ọkọlọtọ n'elu ugwu, na dika ọkọlọtọ n'elu ugwu ntà. 18 Ọ bu kwa n'ihi nka ka Jehova gēchere, imere unu amara, ọ bu kwa n'ihi nka ka agēbuli Ya, inwe obi-ebere n'aru unu: n'ihi na Chineke nke ikpé ka Jehova bu; ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nile ndi nēchere Ya bu. 19 N'ihi na otù ndi gēbi na Zaion nime Jerusalem: i gaghi-akwa ákwá ọzọ ma-ọli: Ọ gēmere gi amara n'ezie n'olu iti-nkpu-gi; mb͕e Ọ nuru Ọ gāza gi otù mb͕e ahu. 20 Onye-nwe-ayi gēnye kwa unu nri ahuhu na miri nmeb͕u, ma ndi-ozizí-gi agaghi-ezobe onwe-ha ọzọ, kama anya-gi abua ganāhu ndi-ozizí-gi: 21 nti-gi abua gānu kwa okwu n'azu-gi, si, Nka bu uzọ, jenu ije nime ya; mb͕e unu nēche iru n'aka-nri, na mb͕e unu nēche iru n'aka-ekpe. 22 Unu gēmeru kwa ihe amachitara arusi ọla-ọcha gi nile apiri api, na ihe awuchitara arusi ọla-edo gi awuru awu: i gātusa ha dika ihe ruru inyi; i gāsi ya, Pua. 23 Ọ gēnye kwa míri-ozuzo nke nkpuru-ọghigha-gi, nke i gāgha n'ala-ubi-gi; na achicha nke ihe-omume nke ala-ubi, ọ gāma kwa abuba, ba uba: n'ubọchi ahu anu-ulo-gi nile gāta nri n'ebe-íta-nri sara mbara. 24 Ehi kwa na umu-inyinya-ibu nālu ubi gāta nri agwara agwa nke nnú di ya, nke ejiworo osekè na ihe-ifucha-ọka fucha ya. 25 N'elu ugwu ọ bula di elu na n'elu ugwu ntà ọ bula di elu ka iyi na ebe miri nērù gādi, n'ubọchi nke oké ob͕ub͕u, mb͕e ulo-elu nile gāda. 26 Ọzọ, ìhè ọnwa gādi ka ìhè anyanwu, ìhè anyanwu gādi kwa okpukpu asa, dika ìhè ubọchi asa, n'ubọchi Jehova gēkechi nkpaji akpajiri ndi-Ya, mb͕e Ọ gāgwọ kwa ọnyá etiputara n'otiti-ya. 27 Le, aha Jehova nēsi n'ebe di anya bia, nēre ọku n'iwe-Ya, nēwere kwa oké anwuru-ọku nākwugo akwugo: eb͕ub͕ere-ọnu-Ya juputara n'oké iwe, ire-Ya di kwa ọku nērichapu erichapu: 28 iku-ume-Ya di kwa ka iyi nērubiga ókè, rue olu ka ọ nēkewa, iji yọ nke ihe-efu yọcha mba nile: bridle nke nēdufu edufu gādi kwa n'àb͕à ndi di iche iche. 29 Abù ka unu gēnwe dika n'abali edoworo ememe nsọ; na ọṅù obi, dika nke onye ji ọ̀jà eje ibà n'ugwu Jehova, rue Oké Nkume nke Israel. 30 Jehova gēme kwa ka anu ebube nke olu-Ya, Ọ gēme kwa ka ahu ndakwasi nke ogwe-aka-Ya, n'ọnuma nke iwe-Ya, na ire-ọku nke ọku nērichapu erichapu, na ntupia, na oké miri-ozuzo, na ákú-miri-ígwé. 31 N'ihi na agēsite n'olu Jehova nyajisia Asiria, Ọ gēji ndele tib͕ue ya. 32 Ngabiga ọ bula nke nkpa-n'aka akara àkà, nke Jehova gēme ka ọ dakwasi ya, gādi kwa n'egwú-otiti na n'ubọ-akwara: ọ bu kwa n'agha di iche iche nke nfeghari ka Ọ gēbuso ha agha. 33 N'ihi na edowo otù Tofet n'usoro site na mb͕e gara aga; e, nke ahu ka edoziworo nye eze; O mewo ya ka ọ di omimi, me ya ka ọ sa mbara: obo-ya bu ọku na ọtutu nkú; nku-ume Jehova, dika iyi brimstone, nāfunwu ya.

Aisaia 31

1 Ahuhu gādiri ndi ahu ndi nārida n'Ijipt ka ewe yere ha aka, ndi nādabere kwa inyinya, tukwasi obi n'ub͕ọ-ala, n'ihi na ha di ọtutu, tukwasi kwa obi na ndi-inyinya, n'ihi na ha nwere ume nke-uku; ma ha eleghi Onye Nsọ nke Israel anya ọma, ha achọghi kwa Jehova! 2 Ma Ya onwe-ya ma-kwa-ra ihe, we me ka ihe ọjọ bia, O wezugakwaghi okwu-Ya nile: ma O biliwo imegide ulo ndi nēme ihe ọjọ na imegide iye-aka nke ndi nālu ajọ ihe. 3 Ma ndi Ijipt bu madu, ha abughi Chineke; inyinya-ha bu kwa anu-aru, ha abughi mọ: Jehova gēseti kwa aka-Ya, onye nēye aka ewe su ngọngọ, onye anēyere aka adà kwa, ọ bu kwa n'otù ka ha nile gāgwusi. 4 N'ihi na otú a ka Jehova sirim, Dika ọdum ma-ọbu nwa-ọdum, nke anākpọkọta ìgwè ndi-ọzùzù-aturu imegide ya, si ede inwù n'elu anu ọ dọb͕utara, ọ dighi-atu ujọ olu-ha, ọ dighi-eweda kwa onwe-ya n'ala n'ihi ùzù-ha: otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha gāridata ibuso ugwu Zaion na ibuso ugwu ntà ya agha. 5 Dika umu-nnunu nēfe efe, otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēb͕ochi Jerusalem; nēb͕ochi nānaputa; nāgabiga nēme ya ka o wepuga onwe-ya. 6 Laghachikutenu Onye ahu Nke umu Israel siri n'aka-Ya wezuga onwe-ha nke-uku. 7 N'ihi na n'ubọchi ahu ha gāju, onye ọ bula ọ ju ihe-efu ọla-ọcha ya nile na ihe-efu ọla-edo ya nile, nke aka-unu mere nye onwe-unu, ibu nmehie. 8 Asiria gāda kwa site na mma-agha nke nābughi nke madu di elu: mma-agha nke nābughi nke madu di ala gērichapu kwa ya: ọ gēsi kwa n'iru mma-agha b͕alaga, umu-okorọbia-ya gāghọ kwa usu ndi nēfè òfùfè. 9 Nkume-ya nke di elu gāgabiga site n'ujọ, ndi-isi-ya gātu kwa ujọ ọkọlọtọ, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, Onye ìhè O nwere di na Zaion, ite-ọku uku O nwere di kwa na Jerusalem.

Aisaia 32

1 Le, n'ezi omume ka otù eze gābu eze, ndi-isi kwa, n'ikpé ziri ezi ka ha gābu ndi-isi. 2 Otù onye gādi kwa ka ebe izonari ifufe, na ebe-nzuzo ipu n'oké miri-ozuzo; dika ọtutu iyi juputara na miri n'ebe kpọrọ nku, dika ǹdò nke oké nkume di elu n'ala nke kpatara ike-ọgwugwu. 3 Agaghi-etechi kwa anya nke ndi nāhu uzọ, nti nke ndi nānu ihe gāṅa kwa nti. 4 Obi nke ndi nēme ngwa ngwa gāghọta kwa ihe-ọmuma, ire nke ndi-nsu gēkwuwa kwa okwu ngwa ngwa. 5 Agaghi-akpọ kwa onye-nzuzu onye amara aha-ya ọzọ, agaghi-asi kwa na onye-aghughọ bu ọgaranya. 6 N'ihi na onye-nzuzu gēkwu ihe-nzuzu, obi-ya gēme kwa ajọ ihe, ime ihe emeruru emeru, na ikwu okwu njehie megide Jehova, ime ka nkpuru-obi nke onye agu nāgu b͕ara aka, na ime ka ihe-ọṅuṅu nke onye akpiri nakpọ nku kọ ukọ. 7 Ihe-ọlu nile nke onye-aghughọ jọ-kwa-ra njọ: onye ahu ezubewo ihe-nzube ọjọ di iche iche iji okwu-ọnu nile nke bu okwu-ugha mebie ndi ewedara n'ala, ọbuná mb͕e ob͕eye nēkwu okwu ikpé ziri ezi. 8 Ma onye amara aha-ya ezubewo ihe amara aha-ha; onye ahu nēguzosi kwa ike n'ime ihe amara aha-ha. 9 Unu ndinyom ndi nọ jū, bilienu, nurunu olum; unu umu-ndinyom ndi nwere ntukwasi-obi, gēnu nti okwu-ọnum. 10 Tukwasi ubọchi ufọdu n'otù nb͕a-arọ, unu ewe me nkpatu, unu ndinyom ndi nwere ntukwasi-obi: n'ihi na ọghughọ-nkpuru-vine agwusiwo, nchikọta-ihe agaghi-abia. 11 Manu jijiji, unu ndinyom ndi nọ jū; menu nkpatu, unu ndinyom ndi nwere ntukwasi-obi: yipunu uwe, b͕ara ọtọ, ke ákwà-nkpe n'úkwù-unu. 12 N'ihi ara nile ka ha ganēti aka n'obi, n'ihi ubi nile anāchọsi ike, n'ihi osisi vine nāmi nkpuru, 13 n'ihi ala ndim, nke ogwu n'uke nēpute nime ya, e, n'elu ulo nile nke obi-utọ n'obodo nāṅuri ọṅu-agha: 14 n'ihi na arapuwo ulo-elu; ab͕anariwo ìgwè obodo; Ofel na ulo nche anọchiwo n'ọnọdu ọb͕à rue mb͕e ebighi-ebi, ebe obi-utọ nke inyinya-ibu-ọhia, ebe-ita-nri nke ìgwè aturu di iche iche; 15 rue mb͕e agāwukwasi ayi Mọ site n'elu, ọzara ewe ghọ ubi ọma, agu kwa ubi ọma n'oké ọhia. 16 Mb͕e ahu ikpé ziri ezi gēnwe ebe-obibi-ya n'ọzara, ezi omume gēbi kwa n'ubi ọma ahu. 17 Ihe ezi omume ahu gāluputa bu udo; ihe nke gēsi n'òfùfè ezi omume ahu puta bu kwa inọ-jū na ntukwasi-obi rue mb͕e ebighi-ebi. 18 Ndim gānọ kwa n'ulo-obibi udo, na n'ebe-obibi di iche iche kwesiri ntukwasi-obi, na n'ebe-izu-ike di iche iche di jū. 19 Ma o gēzo ákú-miri-ígwé, n'ọdida nke oké ọhia; ọ bu kwa n'ọnọdu di ala ka agēme ka obodo a di ala. 20 Ndi ihe nāgara nke-ọma ka unu ndi nāgha nkpuru n'akuku miri nile bu, ndi nēziputa ukwu ehi na inyinya-ibu.

Aisaia 33

1 Ahuhu gādiri gi onye nāpunara madu ihe, ma gi onwe-gi bu onye anāpunaraghi ihe; onye nāghọb͕u kwa aghọb͕u, ma ha aghọb͕ughi gi! mb͕e i napubìri madu ihe, agāpunara gi ihe; mb͕e i ghọb͕ubìri, ha gāghọb͕u gi. 2 Jehova, mere ayi amara; Gi ka ayi leworo anya: buru ogwe-aka-ha kwa-ututu, buru kwa nzọputa-ayi na mb͕e ahuhu. 3 Site n'olu ùzù ka ndi di iche iche b͕alagaworo; site na nbuli-Gi ka mba nile b͕asaworo. 4 Agāchikọta kwa ihe-unu akwatara n'agha dika nchikọta nke ọbubu: dika nb͕aghari nke igurube, otú a ka ọ nāb͕aghari n'elu ya. 5 Jehova di elu; n'ihi na O bi n'elu: O mejuwo Zaion n'ikpe ziri ezi na ezi omume. 6 Ikwesi-ntukwasi-obi gādi kwa na mb͕e-gi nile, iba-uba nke nzọputa na amam-ihe na ihe-ọmuma: egwu Jehova, nke ahu bu àkù-ya. 7 Le, dìnkpà-ha nile nēti nkpu n'èzì: ndi-ozi udo nākwakpọ anya. 8 Uzọ nile atuliri atuli tọb͕ọrọ n'efu, onye nāgabiga n'uzọ akwusiwo: o mebiwo ọb͕ub͕a-ndu, ju obodo nile, ọ gughi madu n'ihe. 9 Ala nēru újú, talata: Lebanon nwere iru-ihere, ọ janwuwo ajanwu: Sheron di ka ala ihe nādighi; Beshan na Kamel nārurupu kwa akwukwọ-ha. 10 Ub͕u a ka M'gēbili, ka Jehova nāsi; ub͕u a ka M'gēme onwem ka M'di elu; ub͕u a ka agēbulim. 11 Unu gātu ime ahihia kpọrọ nku, unu gāmu ahihia-ọka: nku-ume-unu bu ọku nke gērichapu unu. 12 Ndi di iche iche gādi kwa ka lime akpọrọ ọku: dika ogwu eb͕uturu eb͕utu, nke anēsure n'ọku. 13 Unu ndi nọ n'ebe di anya, nurunu ihe M'meworo; unu kwa ndi nọ nso, maranu idi-ikem. 14 Ndi-nmehie nātu oké egwu nime Zaion; ọma-jijiji ejidewo ndi emeruru emeru. Ònye n'etiti ayi gānọ dika ọbìa n'ebe ọku nērichapu erichapu di? ònye n'etiti ayi gānọ dika ọbìa n'ebe ọku nēre ere ebighi-ebi di? 15 Ọ bu onye nējeghari n'ezi omume nile, nke nēkwu kwa okwu nile ziri ezi; nke nāju urù nmeb͕u nile, nke nētichapu ọbu-aka-ya abua n'ijide ihe-iri-ngo, nke nākwuchi nti-ya abua ka ọ ghara inu okwu bayere iwusi ọbara, nke nātachi kwa anya-ya abua ka ọ ghara ilekwasi ihe ọjọ anya; 16 onye ahu gēbi n'ebe di elu: ebe ewusiri ike nke nkume di elu ka ulo-elu-ya gābu: anēnye ya nri-ya; miri-ya kwesiri ntukwasi-obi. 17 Eze n'ima-nma-ya ka anya-gi abua gāhu: ha gāhu ala nke ebe nile ọ sọturu di anya. 18 Obi-gi gēchè èchìchè oké ujọ ahu: òle ebe onye nāgu ọnu nọ? òle ebe onye nātù ego-utu nọ? òle ebe onye nāgu ulo-elu ọnu nọ? 19 Ndi ahu nke nwere anya-ike, i gaghi-ahu ya, bú ndi asusu-ya miri emi kari ọnunu; nke ire-ya nāsu nsu nādighi nghọta. 20 Lekwasi Zaion anya, bú obodo nke mb͕e nile ayi akara àkà: anya-gi abua gāhu Jerusalem na ọ bu ulo-obibi di jū, ulo-ikwū nke anāgaghi-ebupu ebupu, nke anāgaghi-eropu ǹtú-ya ọ bula rue ebighi-ebi, nke anāgaghi-adọbi kwa udọ̀-ya ọ bula. 21 Kama n'ebe ahu ka Onye di ebube, bú Jehova, gānọduru ayi, dika ebe ọtutu osimiri na uzọ di iche iche miri si erù nke sara mbara n'aka abua; ub͕ọ-umara agaghi-aga nime ya, ub͕ọ di ebube agaghi-agabiga kwa n'elu ya. 22 N'ihi na Jehova bu onye-ikpe-ayi, Jehova bu onye nēnye ayi iwu, Jehova bu eze-ayi; Ya onwe-ya gāzoputa ayi. 23 Atọsawo udọ̀-gi nile; ha adighi-ejisi ukwu akpu-ha ike, ha ab͕asaghi ọkọlọtọ-ha: mb͕e ahu ekesara ihe alutara n'agha, bú ihe akwatara n'uba; ndi-ngwurọ lutara ihe-nluta-n'agha. 24 Onye-obibi-ya agaghi-asi, Anamaria ọria: agēbupu ajọ omume nke ndi bi nime ya.

Aisaia 34

1 Bianu nso, unu mba, inu ihe; unu ndi di iche iche kwa, ṅanu nti: ka uwa nu, ya na ùjú-ya; elu-uwa dum madu bi, na ihe nile si nime ya aputa. 2 N'ihi na iwe ka Jehova nēwesa mba nile, O wezugawo ha ka ebibie ha, O were ha nye ka eb͕ue ha. 3 Agētufu kwa ndi-ha eb͕uru eb͕u, ma ozu-ha, ísì ọjọ ha gārigo n'elu, agāb͕aze kwa ugwu site n'ọbara-ha. 4 Usu nile nke ihe elu-igwe gēdè kwa, agāpiakọta kwa elu-igwe dika akwukwọ-odide: usu-ha nile gākpọnwu kwa, dika akwukwọ si akpọnwu dapu n'osisi vine, na dika akwukwọ nke nākpọnwu akpọnwu si adapu n'osisi fig. 5 N'ihi na mma-agham aṅujuwo afọ n'elu-igwe: le, Edom ka ọ gāridakwasi, ridakwasi kwa ndi M'wezugara ka ebibie ha, ikpe ikpe. 6 Mma-agha Jehova juputara n'ọbara, emewo ka ọ ma abuba site n'abuba, site n'ọbara umu-aturu na nkpi, site n'abuba nke akuru ebulu: n'ihi na àjà di Jehova nwere na Bọzra, O nwe-kwa-ra oké ob͕ub͕u n'ala Edom. 7 Atu gēso kwa ha rida, umu-oke-ehi kwa, ha na oke-ehi; ala-ha gāṅuju kwa ọbara afọ, agēme kwa ka ájá-ha ma abuba site n'abuba. 8 N'ihi na ubọchi ibọ̀-ọ́bọ̀ di Jehova nwere, arọ nkwughachi diri ise-okwu Zaion. 9 Iyi-ya nile gāb͕anwe pitch, ájá-ya gāb͕anwe kwa brimstone, ala-ya gāghọ kwa pitch nēre ọku. 10 N'abali ma-ọbu n'ehihie ọ gaghi-anyu anyu; rue mb͕e ebighi-ebi ka anwuru-ọku-ya gākwugo: site n'otù ọb͕ọ rue ọb͕ọ ọzọ ọ gātọb͕ọrọ n'efu; rue mb͕e nile ebighi-ebi ọ dighi onye nāgabiga nime ya. 11 Ma okwolo na ebinta gēnweta ya; okwukwu na ugolo-ọma gēbi nime ya: Ọ gēseti kwa eriri nke itọb͕ọrọ-n'efu na nkume-ọtùtù nke itọb͕ọrọ-nkiti n'elu ya. 12 Ndi-ya amara aha-ha ka ha gākpọ inwe ala-eze, ma ọ dighi onye nọ n'ebe ahu; ndi-isi-ya nile gāghọ kwa ihe-efu. 13 Ogwu gēpú kwa n'ulo-elu-ya nile, akuba na ọhia-ogwu n'ebe-ya nile ewusiri ike: o we ghọ ebe-obibi nkita-ọhia, ogige nke diri enyi-nnunu. 14 Anu-ọhia bi n'ala kpọrọ nku gēzute kwa anu-ọhia nēbe ebe, nkpi-ọhia gākpọ kwa ibe-ya; ọzọ, n'ebe ahu ka lilith gānọdu, chọtara onwe-ya ebe-izu-ike. 15 N'ebe ahu ka agwọ di ngwa gēme akwu-ya, yie àkwá, bua umu, kpokọba ha n'okpuru ǹdò-ya: ọzọ, n'ebe ahu ka ndab͕u gēzukọta, otù na ibe-ya. 16 Chọputanu n'akwukwọ Jehova, gua: ọ dighi otù nime ndia fọduru inọ ya, otù eleghi anya ibe-ya ma ọ biagh: n'ihi na ọnum, nke ahu nyere iwu, Mọ-Ya kwa, Ya onwe-ya chikọtara ha. 17 Ya onwe-ya efewo-kwa-ra ha nzà, aka-Ya ewerewo kwa ya kère ha n'eriri-ọtùtù: rue mb͕e nile ka ha gēnweta ya, rue ọb͕ọ nile ka ha gēnwe ebe-obibi-ha nime ya.

Aisaia 35

1 Obi gātọ ọzara na ala kpọrọ nku utọ; ala ihe nādighi gēteghari kwa egwú ọṅù, b͕awa okoko-ọhia, dika rose. 2 Ọ gāb͕awa nke-uku, teghari kwa egwú ọṅù, e, n'iteghari-egwú-ọṅù na n'iti-nkpu-ọṅù; nsọpuru Lebanon ka agēnye ya, e, ima-nma nke Kamel na Sheron: ndia gāhu ebube Jehova, bú ima-nma nke Chineke-ayi. 3 Menu aka kudara akuda ka ha di ike, b͕a-kwa-nu ikperè nāsu ngọngọ ume. 4 Sinu ndi obi-ha nēme ngwa, Dinu ike, unu atula egwu: le, Chineke-unu! ibọ̀-ọ́bọ̀ nābia, bú nkwughachi nke Chineke; Ya onwe-ya gābia zọputa unu. 5 Mb͕e ahu ka agēmeghe anya ndi-ìsì, ọ bu kwa nti nke ndi nti chiri ka agēmeghe. 6 Mb͕e ahu ka onye-ngwurọ gāmali dika ele, ire onye-ob͕i gēti kwa nkpu ọṅù: n'ihi na n'ọzara ka miri nāb͕awaputa, miri-iyi kwa n'ala ihe nādighi. 7 Mirage gāghọ kwa ọdọ-miri, ala miri nādighi gāghọ kwa isi-iyi juputara na miri: n'ebe-obibi nkita-ọhia, ebe ha nāmakpu amakpu, ogige nke diri amì na papyrus. 8 Uzọ atuliri atuli, ọbuná uzọ, gādi kwa n'ebe ahu, Uzọ nke idi-nsọ ka agākpọ kwa ya; onye ruru árú agaghi-agabiga na ya; ma uzọ ahu gādiri ndi ahu: onye ọ bula nke nāga n'uzọ, ọbuná ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha, ha agaghi-akpafu akpafu. 9 Ọ dighi ọdum gādi n'ebe ahu, ọ dighi kwa anu-ọhia nke di irè gārigo n'elu ya, agaghi-ahu ya n'ebe ahu; ma ndi emeworo ka ha nwe onwe-ha nēje ije n'ebe ahu: 10 ndi Jehova ab͕aputara ab͕aputa gālata kwa, were iti-nkpu-ọṅù bata nime Zaion; ọṅù ebighi-ebi gādi kwa n'isi-ha: obi-utọ na ọṅù ka ha gābiarute, iru-újú na ize-ume ewe b͕alaga.

Aisaia 36

1 O rue, n'arọ nke-iri-na-anọ nke eze, bú Hezekaia, na Senakerib, bú eze Asiria, rigoro imegide obodo nile ewusiri ike nke Juda, were ha. 2 Eze Asiria we si na Lekish ziga Rabshake rue Jerusalem jekuru Hezekaia, ya na oké usu-ndi-agha. O we guzo n'akuku uzọ-miri nke ọdọ-miri di n'elu, n'uzọ atuliri atuli nke ọhia ọsu-ákwà. 3 Elaiakim nwa Hilkaia, nke bu onye-isi ulo, na Shebna, bú ode-akwukwọ, na Joa nwa Esaf, bú onye-ncheta, we pukuru ya. 4 Rabshake we si ha, Biko, sinu Hezekaia, Otú a ka eze uku ahu siri, bú eze Asiria, Gini bu ntukwasi-obi a nke i ji tukwasi obi? 5 Asim, Ọ bu nání okwu eb͕ub͕ere-ọnu, na ndum-ọdu na idi-ike di iji bu agha: ub͕u a ònye ka i tukwasiworo obi, na i nupuwo isi n'okpurum? 6 Le, i tukwasiwo obi n'aru nkpa-n'aka amì a piara apia, bú n'aru Ijipt, nke nwoke nādabere na ya, o we ba n'ọbu-aka-ya, dua ya: otú a ka Fero, bú eze Ijipt, di n'ebe ndi nile nātukwasi ya obi nọ. 7 Ma ọ buru na i sim, Ọ bu Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi tukwasiworo obi: ọ̀ bughi Onye ahu bu Onye Hezekaia wezugara ebe-Ya nile di elu na ebe-ichu-àjà-Ya nile, si Juda, si kwa Jerusalem, N'iru ebe-ichu-àjà nka ka unu gākpọ isi ala? 8 Ma ub͕u a, biko, were onwe-gi mere onye-nwem, bú eze Asiria, ihe-ibe, ka m'nye kwa gi nnù inyinya ise, ọ buru na i puru inyere onwe-gi ndi gānọkwasi ha. 9 Ì gēsi kwa aṅa chighari iru otù onye-ọchi-agha nke ndi-orù onye-nwem ndi kachasi ntà, tukwasiri onwe-gi obi n'aru Ijipt inwe ub͕ọ-ala na ndi-inyinya? 10 Ma ub͕u a ọ̀ bu n'ejighi Jehova ka m'rigoro imegide ala nka ibibi ya? Jehova sirim, Rigo imegide ala nka, bibie ya. 11 Elaiakim na Shebna na Joa we si Rabshake, Biko, gwa ndi-orù-gi okwu n'asusu Siria; n'ihi na ayi onwe-ayi nānu ya: agwa-kwa-la ayi okwu n'asusu ndi-Ju, na nti ndi nọ n'elu mb͕idi. 12 Rabshake we si, Ọ̀ bu ijekuru onye-nwe-gi na ijekuru gi ka onye-nwem ziterem ikwu okwu ndia? ọ̀ bughi n'ihi ndikom ahu ndi nānọdu n'elu mb͕idi, ka ha we soro unu rie ǹsí-ha, ṅu kwa ma-amiri? 13 Rabshake we guzo, were oké olu kpọ n'asusu ndi-Ju, si, Nurunu okwu nile nke eze uku ahu, bú eze Asiria. 14 Otú a ka eze siri, Unu ekwela ka Hezekaia rafue unu: n'ihi na ọ pughi inaputa unu: 15 unu ekwe-kwa-la ka Hezekaia me ka unu tukwasi Jehova obi, si, Jehova aghaghi inaputa ayi; agaghi-enye obodo a n'aka eze Asiria. 16 Unu egela Hezekaia nti: n'ihi na otú a ka eze Asiria siri, Merenum ihe-ngọzi, pukutekwam; ri-kwa-nu, nwoke ọ bula nkpuru vine-ya, na nwoke ọ bula nkpuru osisi fig ya, ṅu-kwa-nu, nwoke ọ bula miri olùlù-miri-ya: 17 rue mb͕e m'biara chiri unu je n'ala dika ala-unu, bú ala ọka na manya-vine ọhu, ala achicha na ubi-vine. 18 Lezienu anya ka Hezekaia we ghara irafu unu, si, Jehova gānaputa ayi. Chi nile nke mba nile ọzọ, hà anaputawo, onye ọ bula ala-ya, n'aka eze Asiria? 19 Òle ebe chi nile nke Hemat na Apad di? òle ebe chi nile nke Sefavaim di? hà anaputawo kwa Sameria n'akam? 20 Òle ndi n'etiti chi nile nke ala ndia ka ha bu, bú ndi naputara ala-ha n'-akam, na Jehova gānaputa Jerusalem n'akam? 21 Ma ha b͕ara nkiti, ha azaghi kwa ya okwu: n'ihi na ihe eze nyere n'iwu bu nka, si, Unu azala ya. 22 Elaiakim nwa Hilkaia, nke bu onye-isi ulo, na Shebna, bú ode-akwukwọ na Joa nwa Esaf, bú onye-ncheta, we biakute Hezekaia, ha na uwe-ha dọwara adọwa, ha we gosi ya okwu nile nke Rabshake.

Aisaia 37

1 O rue, mb͕e eze, bú Hezekaia, nuru ya, na ọ dọwara uwe-ya nile, were ákwà-nkpe kpuchie onwe-ya, ba n'ulo Jehova. 2 Ọ we zìe Elaiakim, nke bu onye-isi ulo, na Shebna, bú ode-akwukwọ na ndi okenye ndi-nchu-àjà, ndi wereworo ákwà-nkpe kpuchie onwe-ha, o we zìe ha jekuru Aisaia nwa Emoz, bú onye-amuma. 3 Ha we si ya, Otú a ka Hezekaia siri, Ubọchi ahuhu na iba-nba na nlelì-anya ka ubọchi ta bu: n'ihi na umu abiaruwo ebe-nmuputa, ma ike adighi imu ha. 4 Eleghi anya Jehova, bú Chineke-gi, gānu okwu nile nke Rabshake, onye eze Asiria, bú onye-nwe-ya, ziteworo ita Chineke di ndu uta, eleghi anya Ọ gābara okwu nile nke Jehova, bú Chineke-gi, nuworo nba: gi buli kwa ekpere-gi n'ihi ndi fọduru ndi ahutaworo. 5 Ndi-orù eze, bú Hezekaia, we biakute Aisaia. 6 Aisaia we si ha, Otú a ka unu gāsi onye-nwe-unu, Otú a ka Jehova siri, Atula egwu n'ihi okwu nile nke i nuworo, nke ndi nējere eze Asiria ozi jiri kwulum. 7 Le, M'nētiye otù mọ nime ya, ọ gānu kwa akukọ, laghachi n'ala-ya; m'gēme kwa ka ọ da site na mma-agha n'ala-ya. 8 Rabshake we laghachi, huta eze Asiria ka ọ nēbuso Libna agha: n'ihi na O nuru na o siwo na Lekish bulie ije. 9 Ọ we nu ihe bayere Tiahaka, bú eze Etiopia, si, Ọ putawo ibuso gi agha. O we nu, zìe ndi-ozi jekuru Hezekaia, si, 10 Otú a ka unu gāgwa Hezekaia bú eze Juda, okwu, si, Ekwela ka Chineke-gi, Onye gi onwe-gi nātukwasi obi, rafue gi, si, Agaghi-enye Jerusalem n'aka eze Asiria. 11 Le, gi onwe-gi anuwo ihe ndi-eze Asiria meworo ala nile, n'iwezuga ha ka ebibie ha: àgānaputa kwa gi onwe-gi? 12 chi nile nke mba nile ọzọ, hà anaputawo ha, bú ndi nnam-hà bibiworo, Gozan, na Haran, na Rezef, na umu Eden, ndi nọ na Telasa? 13 Òle ebe eze Hemat di, na eze Apad, na eze obodo Sefavaim na Hina na Iva? 14 Hezekaia we nata akwukwọ n'aka ndi-ozi ahu, gua ya: Hezekaia we rigorue ulo Jehova, b͕asa ya n'iru Jehova. 15 Hezekaia we kpe ekpere n'iru Jehova, si, 16 Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke Israel, Onye nēbi n'etiti cherubim, Gi onwe-gi bu Chineke, nání Gi, nke ala-eze nile nke uwa; Gi onwe-gi mere elu-igwe na uwa. 17 Jehova, tọ nti-Gi n'ala, nu; Jehova, saghe anya-Gi abua, hu: nu kwa okwu nile nke Senakerib, nke zitere madu ita Chineke di ndu uta. 18 N'ezi-okwu, Jehova, ndi-eze Asiria emewo ka ala nile na ala-ha tọb͕ọrọ n'efu, 19 ha etiyewo kwa chi nile ha n'ọku: n'ihi na ọ bughi chi ka ha bu, kama ha bu ọlu aka madu, bú osisi na nkume; ha we me ka ha la n'iyì. 20 Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke-ayi, zọputa ayi n'aka-ya, ka ala-eze nile nke uwa we mara na Gi onwe-gi bu Jehova, nání Gi. 21 Aisaia nwa Emoz we zigara Hezekaia ozi, si, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Ekpere nke i kpeworom bayere Senakerib, bú eze Asiria, anuwom ya. 22 Nka bu okwu nke Jehova kwuworo bayere ya: Nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú ada Zaion elelìwo gi anya, chìnye gi ihere n'iru; ada Jerusalem efufewo isi n'azu gi. 23 Ònye ka i taworo uta, kwulu kwa? Ònye ka i mewo-kwa-ra olu-gi ka ọ di elu, weli kwa anya-gi abua imegide Ya? ọ bu imegide Onye Nsọ nke Israel. 24 I siri n'aka ndi-orù-gi ta Onye-nwe-ayi uta, si, Ọtutu ub͕ọ-alam ka mu onwem jiri rigorue ebe di elu nke ugwu nile, rue akuku ime nile nke Lebanon; m'gēb͕utu kwa osisi cedar ya nile toro ogologo, na osisi fir ya nile arọputara arọputa: m'gābà kwa n'ebe di elu nke nsọtu-ya, oké ọhia nke ubi ọma ya. 25 Mu onwem egwuwo olùlù-miri, ṅua miri, m'gēwere kwa ọbu-ukwu nke nzọli-ukwum me ka osimiri Nail nile nke Ijipt tasia. 26 Ì nughi na ọ bu na mb͕e di anya gara aga ka M'meworo ya, na ọ bu site n'ubọchi mb͕e ochie ka M'kpuworo ya? ugbu a emewom ka ọ biarue, na i gābu onye gākwada obodo ewusiri ike ka ha we ghọ obo tọb͕ọrọ n'efu. 27 Ndi bi nime ha we ghọ ndi aka-ha di nkpunkpu, ha turu ujọ, ihere we me ha; ha ghọrọ ihe-ọkukú nke ubi, na akwukwọ ahihia ndu, na ahihia nke elu-ulo, na ubi ọka tutu o tolite. 28 Ma amowom nnọdu-gi, na ọpupu-gi, na nbata-gi, na otú i nākpali onwe-gi imegidem. 29 N'ihi na i nākpali onwe-gi imegidem, na n'ihi na npako-gi arigowo ba na ntim abua, M'gētiye kwa nb͕a-aka-imim n'imi-gi, na bridle nkem n'eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua, me ka i laghachi n'uzọ ahu nke i siri bia. 30 Ma nka gāburu gi ihe-iriba-ama: unu gēri n'arọ a ihe nēpú n'onwe-ya, na n'arọ nke-abua ihe si na nke ahu pue; ma n'arọ nke-otọ ghanu nkpuru, we kwa ihe ubi, ku kwa vine n'ubi-vine, ri kwa nkpuru-ha. 31 Ndi b͕apuru ab͕apu nke ulo Juda ndi fọduru gāb͕agide kwa nkpọrọgwu n'ala n'okpuru ọzọ, mi kwa nkpuru n'elu. 32 N'ihi na ọ bu na Jerusalem ka ndi fọduru afọdu gēsi puta, ndi b͕apuru ab͕apu gāputa kwa n'ugwu Zaion: ekworo Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēme nka. 33 N'ihi ya ka Jehova kwuru okwu bayere eze Asiria otú a, si, Ọ gaghi-abà n'obodo a, ọ gaghi-ab͕a otù àkú n'ebe ahu, ọ gaghi-ewere kwa ọta bia n'iru ya, ọ gaghi-awukọta kwa ihe-ntukọba imegide ya. 34 N'uzọ o siri bia, n'uzọ ahu ka ọ gālaghachi, ọ gaghi-abà kwa n'obodo a, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 35 M'gēb͕ochi kwa obodo a izọputa ya, n'ihi Onwem, na n'ihi Devid, bú orùm. 36 Mọ-ozi nke Jehova we pua, tib͕ue n'ọmuma-ulo-ikwū Asiria orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ atọ, na nnù ndikom abua na ọgu iri: madu we bilie n'isi-ututu, ma, le, ha nile bu ozu nwuru anwu. 37 Senakerib, bú eze Asiria, we bulie ije, je, laghachi, biri na Nineve. 38 O rue, mb͕e ya onwe-ya nākpọ isi ala n'ulo Nisrok, bú chi-ya, na Adramelek na Shareza, bú umu-ya ndikom, were mma-agha tib͕ue ya: ma ndi ahu wepugara onwe-ha la n'ala Ararat. Isa-hadon, bú nwa-ya, we buru eze n'ọnọdu ya.

Aisaia 38

1 Na mb͕e ahu Hezekaia riara ọria inwu anwu. Aisaia, bú onye-amuma, bú nwa Emoz, we biakute ya, si ya, Otú a ka Jehova siri, Nye ulo-gi iwu; n'ihi na onye nānwu anwu ka i bu, I gaghi-adi kwa ndu. 2 Hezekaia we chigharia iru-ya che mb͕idi iru, kpere Jehova, 3 si, Biko, Jehova, biko, cheta otú m'jeghariworo n'iru Gi n'ezi-okwu na n'obi zuru okè, ọ bu kwa ihe di nma n'anya-Gi ka m'meworo. Hezekaia we kwa ákwá nke-uku. 4 Okwu Jehova we rue Aisaia nti, si, 5 Je, si Hezekaia, Otú a ka Jehova, bú Chineke Devid nna-gi, siri, Anuwom ekpere-gi, ahuwom anya-miri-gi: le, M'nātukwasi arọ iri na ise n'ubọchi-gi. 6 M'gānaputa kwa gi na obodo a n'ọbu-aka eze Asiria, b͕ochi kwa obodo a. 7 Nka gābu-kwa-ra gi ihe-iriba-ama sitere n'aka Jehova, na Jehova gēme ihe a nke O kwuru: 8 le, M'nēme ka onyinyo nke di n'ebe-nrigo, nke ridaworo n'ebe-nrigo Ehaz site n'anyanwu, ka ọ la azu nzọ-ukwu ebe-nrigo iri. Anyanwu we la azu nzọ-ukwu ebe-nrigo iri n'ebe-nrigo ahu nke ọ ridaworo n'elu ya. 9 Odide-akwukwọ nke Hezekaia eze Juda, mb͕e ọ riara ọria, o we puta N'ọrìa-ya nwe aru-ike. 10 Mu onwem siri, Ọ bu n'idi-jū nke ubọchim nile ka m'ghaghi ila n'ọnu-uzọ-ama nke ala-mọ. Anapuwom arọm fọduru afọdu. 11 Asirim, M'gaghi-ahu Ja, ọbuná Ja n'ala ndi di ndu: M'gaghi-elegide kwa madu anya ọzọ n'etiti ndi bi n'ala ọgwugwu-ndu. 12 Emewo ka ebe-obibim bulie ije, esiwo kwa n'ebe m'nọ bulaga ya dika ulo-ikwū onye-ọzùzù-aturu: Apiakọtawom ndum dika ọkpa-ákwà si apiakọta ákwà; na ǹkwé-ákwà ka Ọ gēbipum: Site n'ehihie rue abali I gēme ka m'gwusia. 13 Edozirim nkpuru-obim rue ututu; dika ọdum, otú a ka Ọ nānyaji ọkpukpum nile: Site n'ehihie rue abali I gēme ka m'gwusia. 14 Dika eleke ma-ọbu ub͕ala, otú a ka m'nēbe ebe; Anamekwo ákwá dika nduru: anyam abua atalatawo n'ile anya n'elu; Jehova, anēmeb͕um emeb͕u, nọrọm mbe. 15 Gini ka m'gēkwu? Ọ gwaram okwu, Ya onwe-ya me-kwa-ra ya: M'ganēje nwayọ arọm nile n'ihi idi-ilu nke nkpuru-obim. 16 Onye-nwe-ayi, ihe ndia ka madu ji adi ndu, Ọ bu kwa nime ha ka ndu mọm dichasi: I gēme kwa ka aru dim ike; Gi me kwa ka m'di ndu. 17 Le, ihe m'ji nwe ihe di ilu ilu bu ka m'we nata udo: Ma Gi onwe-gi huru nkpuru-obim n'anya si-ike, we si n'olùlù nke itọb͕orọ-n'efu dọputam: N'ihi na I tufuru nmehiem nile n'azu Gi. 18 N'ihi na ala-mọ adighi-ekele Gi, ọnwu adighi-eto Gi: Ndi nārida n'olùlù adighi-ele anya ezi-okwu-Gi. 19 Onye di ndu, onye di ndu, onye ahu gēkele Gi, dika m'si eme ta: Nna gēme ka umu mara ezi-okwu-Gi. 20 Jehova ejikerewo izọputam: Ubọ-akwaram nile ka ayi ganākpọUbọchi nile nke ndu-ayi n'ulo Jehova. 21 Aisaia we si, Ka ha were mbadamba fig, makwasi ya n'elu ihe-ofifi ahu, ọ gādiri ndu. 22 Hezekaia we si, Gini gābu ihe-iriba-ama na m'gārigoru ulo Jehova n'ubọchi nke-atọ?

Aisaia 39

1 Na mb͕e ahu Merodak-baladan nwa Baladan, bú eze Babilon, zigara Hezekaia akwukwọ na onyinye-inata-iru-ọma: ọ nu-kwa-ra na Hezekaia riarari ọria, we nwe aru-ike. 2 Hezekaia we ṅuria ọṅu bayere ha, me ka ha hu ulo nke ihe-ya di oké ọnu-ahia, bú ọla-ọcha-ya, na ọla-edo-ya, na uda-ya di iche iche, na ezi manu-ya, na ulo nile nke ihe-agha-ya nile, na ihe nile nke achọtara n'àkù-ya nile: ọ dighi ihe di n'ulo-ya, ma-ọbu n'ala nile ọ nāchi, nke Hezekaia nēmeghi ka ha hu. 3 Aisaia, bú onye-amuma, we biakute eze, bú Hezekaia, si ya, Gini ka ndikom ndia siri gi? òle ebe ka ha si kwa biakute gi? Hezekaia we si, Ọ bu n'ala di anya ka ha si biakutem, ọbuná na Babilon. 4 Ọ si, Gini ka ha huru n'ulo-gi? Hezekaia we si, Ihe nile nke di n'ulom ka ha huru: ọ dighi ihe di n'àkùm nile nke m'nemeghi ka ha hu. 5 Aisaia we si Hezekaia, Nuru okwu Jehova nke usu nile nke ndi-agha. 6 Le, ubọchi nābia, na ihe nile di n'ulo-gi, na nke nna-gi-hà debeworo n'ulo-àkù rue ta, agēburu ha je Babilon: ọ dighi ihe gāfọdu, ka Jehova siri. 7 Ufọdu kwa nime umu-gi ndikom, ndi gēsi n'aru-gi puta, ndi i gāmuta, ha gāchiri ha; ha gābu kwa ndi-onozi n'ulọ uku eze Babilon. 8 Hezekaia we si Aisaia, Ọ di nma, bú okwu Jehova nke i kwuworo. Ọ si kwa, N'ihi na udo na ezi-okwu gādi n'ubọchim nile.

Aisaia 40

1 Kasienu, kasienu ndim obi, ka Chineke-unu nāsi. 2 Gwanu Jerusalem okwu gābà ya n'obi, kpọ-kwa-nu ya òkù, si, na obubu-agha-ya ezuwo, na ahuhu ajọ omume-ya atọjuwo Chineke utọ, na ọ natawo n'aka Jehova okpukpu abua n'ihi nmehie-ya nile. 3 Ọ bu olu nke onye nākpọ nkpu n'ọzara, si, Dozienu uzọ Jehova, menu ka uzọ atuliri atuli guzoziere Chineke-ayi n'ala ihe nādighi. 4 Agēme ndagwurugwu ọ bula ka ọ di elu, agēme kwa ka ugwu ọ bula na ugwu ntà ọ bula di ala: ebe di nkputankpu gāghọ kwa, ebe guzoziri eguzozi, nkume nile di elu gāghọ kwa ebe di lari: 5 agēkpughe kwa ebube Jehova, anu-aru nile, bú madu, gāhukọ kwa ya n'otù: n'ihi na ọnu Jehova ekwuwo. 6 Ọ bu olu onye nāsi, Kpọ nkpu. Otù onye we si, Gini ka m'ganākpọ nkpu? Anu-aru nile bu ahihia, ima-nma-ya nile di kwa ka okoko ọhia: 7 ahihia akpọnwuwo, okoko-ọhia ajunwuwo; n'ihi na iku-ume Jehova ekukwasiwo ya: n'ezie ahihia ka ndi ahu bu. 8 Ahihia akpọnwuwo, okoko-ọhia ajunwuwo: ma okwu Chineke-ayi gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi. 9 Rigo n'elu ugwu di elu, gi nwanyi nēzisa ozi ọma, bú Zaion; welie olu-gi n'ike, gi nwanyi nēzisa ozi ọma, bú Jerusalem; welie ya, atula egwu; si obodo nile nke Juda, Le, Chineke-unu! 10 Le, Ọnye-nwe-ayi Jehova gābia dika onye di ike, ogwe-aka-Ya ganāchi-kwa-ra Ya: le, ọkwukwu-ugwọ-Ya di n'aka-Ya, ugwọ-ọlu-Ya di kwa n'iru Ya. 11 Dika onye-ọzùzù-aturu ka Ọ gāzù ìgwè aturu-Ya, n'ogwe-aka-Ya ka Ọ gāchikọta umu-aturu, ọ bu kwa n'obi-Ya ka O gēkuru ha, Ọ gēwere nwayọ nēdu ndi nēnye umu ara. 12 Ònye tùworo miri nile n'ọbu-aka-Ya, were ntù-aka tùputa elu-igwe, nagidezue ájá nke uwa na mb͕é, sì ugwu nile n'ihe-osìsì, tùa ugwu ntà nile n'ihe-ọtùtù? 13 Ònye tùputaworo ma-obu nke Jehova, ma-ọbu, dika onye-ndum-ọdu-Ya, nēme ka Ọ mara ihe? 14 Yà na onye b͕ara ìzù? ònye mere ka Ọ ghọta ihe? ònye zíri Ya ihe n'okporo-uzọ ikpé, zí kwa Ya ihe-ọmuma, me kwa ka Ọ mara uzọ nghọta? 15 Le, aguwo mba nile n'otù ntu-miri nātupu n'ite-miri, na n'uzuzu nke ihe-ọtùtù: le, Ọ nāchili agwe-etiti dika ifurifu-ihe. 16 Lebanon ezughi kwa isure ọku, anu-ọhia-ya ezughi kwa isure àjà-nsure-ọku. 17 Mba nile di ka ihe-efu n'iru Ya; dika ihe nērughi ihe-efu na ebe tọb͕ọrọ n'efu ka aguworo ha nye Ya. 18 Ònye kwa ka unu gāsi na Chineke yiri ya? ma-ọbu ìhe-oyiyi gini ka unu gēdo n'usoro n'ebe Ọ nọ? 19 Arusì apiri api, onye-ọ̀kà b͕azere ya, onye-nnucha-ọla nāmachita ya ọla-edo, ọ bu kwa iyab͕a ọla-ọcha ka ọ nākpuru ya. 20 Onye dara ob͕eye kari ichu àjà-nbuli di otú a nārọputa osisi nke nādighi-ere ure; onye-ọ̀kà nke mara ihe ka ọ nāchọputara onwe-ya idozi arusi apiri api nke anāgaghi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya. 21 Ùnu amaghi? ùnu anughi? ègosighi unu ya site na mb͕e mbu? ùnu aghọtaghi site na ntọ-ala nile nke uwa? 22 Ọ bu Onye ahu Nke nānọdu n'elu buruburu uwa, ndi bi nime ya ewe di ka ogugu; Nke nēseti elu-igwe dika ákwà di nfe, we b͕asa ha dika ulo-ikwū ibi ebi: 23 Nke nēme ndi-isi ka ha ghọ ihe-efu; Ọ mewo ndi-ikpe uwa ka ha di ka ebe tọb͕ọrọ n'efu. 24 E, akākughi ha dika osisi: e, akāghaghi ha dika nkpuru: e, ogwe-osisi-ha akāb͕aghi nkpọrọgwu n'ala: ọzọ kwa, O kukwasiwo ha ume, ha we kpọnwua, oké ifufe nēfepu kwa ha dika ahihia-ọka kpọrọ nku. 25 Ònye kwa ka unu gāsi na Mu yiri ya, M'we ra ka ya? ka Onye Nsọ nāsi. 26 Welienu anya-unu elu, hu: ọ̀ bu Onye kère ihe ndia? ọ bu Onye ahu Nke nēme ka usu-ha puta n'ọnu-ọgugu: ha nile n'aha-ha ka Ọ nākpọ; site n'iba-uba nke ike-Ya, na n'ihi na O nwere ume n'ike, ọ dighi ihe fọduru nke anāgughi. 27 N'ìhi gini ka i nāsi, gi Jekob, ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka i nēkwu, gi Israel, si, Uzọm ezonariworo Jehova, ọzọ, ikpém esiwo n'ebe Chinekem nọ gabiga? 28 Ì maghi? ì nughi? Chineke nke mb͕e ebighi-ebi ka Jehova, Onye kèworo nsọtu nile nke uwa, bu; Ọ dighi-ada #mbà, ike adighi-agwu kwa Ya; ọ dighi ngwuputa anēgwuputa nghọta-Ya. 29 Ọ bu Onye nēnye onye dara #mbà ike; onye ike nādighi ka Ọ nēme kwa ka ọ nwe ume n'uba. 30 Ọbuná umu-ckoro nāda #mbà, ike nāgwu kwa ha, ọbuná umu-okorọbia nāsu ngọngọ da: 31 ma ndi nēle anya Jehova gāb͕anwe ike-ha; ha gēfego elu na nkù dika ugo; ha gāb͕a ọsọ, ike agaghi-agwu kwa ha; ha gēje ije, ghara ida #mbà.

Aisaia 41

1 B͕anu nkiti gem nti, unu agwe-etiti; ka ndi nile di iche iche b͕anwe kwa ike-ha: ka ha biarue nso; ka ha kwue okwu: ka ayi biarue onwe-ayi nso ikpe ikpe. 2 Ònye kpọteworo otù onye site n'ọwuwa-anyanwu, onye Ọ kpọrọ n'ezi-omume ibiarute ukwu-Ya? Ọ nēwere mba di iche iche nye n'iru ya, Ọ nēme kwa ya ka ọ nwe ike n'aru ndi-eze: O nēwere ha nye mma-agha-ya dika ájá, dika ahihia-ọka kpọrọ nku nke anēfepu efepu, otú a ka Ọ nēwere ha nye uta-ya. 3 Ọ nāchu ha, gabiga n'udo; o jighi ukwu-ya abà n'uzọ. 4 ònye luworo ya, me ya, nākpọ ọb͕ọ nile site na mb͕e mbu? Ọ bu Mu onwem, bú Jehova, Onye mbu, Nke nọye-kwa-ra ndi ikpe-azu, Mu onwem bu Onye ahu. 5 Agwe-etiti nile huru, we tua egwu; nsọtu nile nke uwa nāma jijiji: ha biaruru nso, we bia. 6 Ha yeritara onwe-ha aka n'otù n'otù; onye ọ bula nime ha nāsi nwa-nne-ya, Di ike. 7 Onye-ọ̀kà we me ka onye-nnucha-ọla di ike, onye ji otùtù akwọ ihe murumuru mere ka onye nētù osiama di ike, nēkwu okwu bayere nkpukọta, si, Nke ahu di nma: o were ǹtú kpọgidesi ya ike ka ewe ghara iwezuga ya n'ọnọdu-ya. 8 Ma gi onwe-gi, Israel, orùm, Jekob onye M'rọputara, nkpuru Abraham, bú onye nāhum n'anya; 9 gi onye M'jidesiworo ike site na nsọtu nile nke uwa, ọ bu kwa n'akuku-ya nile ka M'kpọputara gi, we si gi, Orùm ka i bu, arọputawom i, ajughm i aju: 10 atula egwu, gi ka M'nọyere: elela anya buruburu n'ujọ, n'ihi na Mu onwem bu Chineke-gi: M'gāb͕a gi ume; e, M'gēyere gi aka; e, M'gēji aka-nri nke ezi omumem kwagide gi. 11 Le, ihere gēme ndi ahu nile ndi iwe-ha di ọku n'aru gi, agētiye ha n'ọnọdu-ihere: ha gādi ka ihe nābughi ihe, we la n'iyì, bú ndi nāluso gi ọ̀gù. 12 I gāchọ ha, ma i gaghi-achọta ha, bú ndi gi na ha nēse okwu: ha gādi ka ihe nābughi ihe na dika ihe-efu, bú ndi nēbuso gi agha. 13 N'ihi na Mu onwem, Jehova, Chineke-gi, nējidesi aka-nri-gi ike, bú Onye nāsi gi, Atula egwu, Mu onwem eyeworo gi aka. 14 Atula egwu, gi idide, bú Jekob, unu ndikom Israel; Mu onwem eyeworo gi aka, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, ọzọ, Onye-nb͕aputa-gi bu Onye Nsọ nke Israel. 15 Le, emewom ka i ghọ ihe-nkpọre eji azọcha ọka, bú ihe di nkọ di ọhu nwere ezé: i gāzọcha ugwu, zọpia ha, i gēme kwa ugwu ntà ka ha di ka ib͕ob͕o-ọka. 16 I gāfucha ha, ifufe gēfepu kwa ha, oké ifufe gēfesa kwa ha: ma gi onwe-gi gēteghari egwú ọṅù na Jehova, n'Onye Nsọ nke Israel ka i gānya isi. 17 Ndi ewedara n'ala na umu-ob͕eye nāchọ miri ma ọ dighi nke dinu, ire-ha kpọsiri nku n'ihi akpiri kpọrọ nku; Mu onwem, bú Jehova, gāza ha, Mu, bú Chineke Israel, M'gaghi-arapu ha. 18 M'gākwaghe osimiri n'elu ugwu di iche iche ọhia nādighi, na isi-iyi n'etiti ndagwurugwu di iche iche: M'gēme ka ọzara ghọ ọdọ-miri juputara na miri, me kwa ka ala ọkpọ-nku ghọ ebe miri nāsuputa. 19 M'gāku n'ọzara osisi cedar na osisi acacia na osisi myrtle na osisi manu; M'gāmakọta n'ala ihe nādighi osisi fir na osisi pine na osisi cypress: 20 ka ha we hu, mara, tukwasi obi, nwe uche ighọta n'otù, na aka Jehova mere nka, na Onye Nsọ nke Israel kère ya. 21 Wetanu okwu-ikpe-unu nso, ka Jehova nāsi; butenu ihe nile unu dabere nso, ka Eze Jekob nāsi. 22 Ka ha bute ha nso, gosi ayi ihe ahu nke gēme: gosinu ihe nile emere na mb͕e mbu, ihe ha bu, ka ayi we tukwasi ha obi-ayi, we mara ikpe-azu-ha; ma-ọbu menu ka ayi nuru ihe ahu nile nke nābia. 23 Gosinu ihe ahu nile gābia n'ọdi-n'iru, ka ayi we mara na chi ka unu bu: e, menu ezi ihe, ma-ọbu menu ihe ọjọ, ka ayi we lerita onwe-ayi anya gburugburu n'ujọ, hu ya n'otù. 24 Le, unu onwe-unu sitere n'ihe nābughi ihe, ọlu-unu site-kwa-ra n'ihe-efu: ihe-árú ka onye nārọputa unu bu. 25 Akpọtewom otù onye site n'Ugwu, o we bia, otù onye site n'ọwuwa-anyanwu nke gākpọku aham: ọ gābiakwasi kwa ndi nọchiri anya eze dika agāsi na ha bu urọ, na dika ọkpu-ite si azọ ájá. 26 Ònye gosiworo ya site na mbu, ka ayi we mara? na site na mb͕e gara aga, ka ayi we si, Ọ bu onye ezi omume? e, ọ dighi onye nēgosi, e, ọ dighi onye nēme ka ayi nuru, e, ọ dighi onye nānu okwu-ọnu-unu. 27 Abum onye mbu isi Zaion, Le, le ha: M'gēnye kwa Jerusalem onye nēzisa ozi ọma. 28 M'we le, ma ọ dighi onye M'huru; n'etiti ndia kwa, ma ọ dighi onye-ndum-ọdu di, ka M'we jua ha ajuju, ha we zaghachim okwu. 29 Le, ha nile bu ajọ ihe; ihe-efu ka ọlu nile ha bu: ifufe na ebe tọb͕ọrọ n'efu ka arusi nile ha awuru awu bu.

Aisaia 42

1 Le orùm, onye M'nējide aka; onye nkem M'rọputara, onye ihe-ya tọrọ nkpuru-obim utọ: atukwasiwom ya Mọm; ikpé ka ọ gēweputara mba nile. o 2 Ọ gaghi-eti nkpu, ọ gaghi-eweli kwa olu-ya elu, Ọ gaghi-eme kwa ka anu olu-ya n'èzí. 3 Ọ gaghi-akpaji amì apiara apia, ọ gaghi-emenyu kwa ogho-oriọna nēnwu inyoghi-inyogh: n'ezi-okwu ka ọ gēme ka ikpé puta. 4 Ọ gaghi-enwu inyoghi-inyoghi, agaghi-apia kwa ya apia n'obi, rue mb͕e o gēdowori ikpé n'uwa; ọ bu kwa iwu-ya ka agwe-etiti nile gēchere. 5 Otú a ka Chineke, bú Jehova, siri, bú Onye kèworo elu-igwe, seti kwa ha; Onye meworo uwa na ihe nile nke si nime ya aputa ka ọ sa mbara; Onye nēnye ndi bi n'elu ya ume ha nēku, Onye nēnye kwa ndi nējeghari nime ya mọ: 6 Mu onwem, bú Jehova, akpọwo gi n'ezi omume, M'gējide kwa aka-gi, chebe gi, nye gi ka i buru ọb͕ub͕a-ndu nke ndim, ka i buru kwa ìhè nke mba nile; 7 imeghe anya nile kpuru ìsì, ime ka onye-nkpọrọ si n'ebe emechibidoworo ya puta, ime ka ndi nānọdu n'ọchichiri si n'ulo-nkpọrọ puta. 8 Mu onwem bu Jehova; nke ahu bu aham: M'gaghi-enye kwa onye ọzọ nsọpurum, M'gaghi-enye kwa arusi di iche iche apiri api otutom. 9 Ihe mbu, le, ha abiawo, ọ bu kwa ihe ọhu di iche iche ka Mu onwem nēgosi: tutu ha epue anameme ka unu nuru ha. 10 Bùkuenu Jehova abù ọhu, kwusanu otuto-Ya site na nsọtu uwa; unu ndi nārida n'oké osimiri, na ùjú-ya, agwe-etiti nile, na ndi bi ha. 11 Ka ọzara na obodo-ya nile welie olu-ha, obodo ntà nile Kida bi: ka ndi bi na Sela tie nkpu ọṅù, ka ha si n'elu ugwu nile tisie nkpu ike. 12 Ka ha nye Jehova nsọpuru, gosi kwa otuto-Ya n'agwe-etiti nile. 13 Jehova gāputa dika dike; dika onye-agha ka Ọ gākpọte ekworo: Ọ gēti nkpu agha, e, Ọ gēti oké nkpu agha; n'imegide ndi-iro-Ya ka Ọ nēme Onwe-ya dike. 14 Edebewom ọnum du site na mb͕e ebighi-ebi gara aga; anamab͕a nkiti, jisie onwem ike: dika nwanyi ime neme, otú a ka M'gāsu, udè, ku ume ngwa ngwa, Kusie ume ike n'otù. 15 M'gēme ugwu na ugwu ntà ka ha kọ akọ, ihe-ọkukú-ha nile ka M'gēme kwa ka ọ kpọnwua; M'gēme kwa osimiri ka ha ghọ agwe-etiti, me kwa ka ọ̀dọ-miri nile takọ. 16 M'ga-eme kwa ka ndi-ìsì je ije n'uzọ ha nāmaghi; n'okporo-uzọ ha nāmaghi ka M'gēme ka ọchichiri buru ìhè n'iru ha, me kwa ebe b͕agọrọ ab͕agọ ka ha guzozie. Ihe ndia ka M'gēme, M'gaghi-arapu kwa ha. 17 Ha gālaghachi azu, ihere gēme ha nke-uku, bú ndi nātukwasi arusi nile apiri api obi, ndi nāsi arusi awuru awu, Unu onwe-unu bu chi-ayi. 18 Unu ndi nti chiri, nurunu; unu ndi-ìsì kwa legidenu anya, ka unu we hu uzọ. 19 Ònye kpuru ìsì, ma-ọbughi orùm, ma-ọbu ònye ka nti chiri, dika onye-ozim M'nēziga? ònye kpuru ìsì dika onye Mu na ya di n'udo, ma-ọbu ònye kpuru ìsì dika orù Jehova? 20 I huwo ọtutu ihe, ma i dighi-ariba ama; nti-ya abua ghere oghe, ma ọ dighi-anu ihe. 21 Ọ tọrọ Jehova utọ, n'ihi, ezi omume-Ya, ime ka iwu-Ya di uku, na ime ka ọ di ebube. 22 Ma ndi nka bu ndi alutaworo ihe-ha n'agha na ndi apunaraworo ha ihe; ha adawo n'ib͕udu n'olùlù, ha nile, ọ bu kwa n'ulo-nkpọrọ di iche iche ka ezobeworo ha: ha aghọwo ihe-nluta-n'agha, ma ọ dighi onye-nnaputa; ha aghọwo ihe apunaraworo madu, ma ọ dighi onye nāsi, Nyeghachi. 23 Ònye n'etiti unu gēge nti na nka? ònye gāṅa nti, we nu ihe n'ọdi-n'iru? 24 Ònye were Jekob nye ka ọ ghọ ihe apunaraworo madu, were Israel nye ndi nāluta ihe n'agha? ọ̀ bughi Jehova? bú Onye ayi mehieworo megide, Onye ha nēkweghi kwa eje ije n'uzọ-Ya nile, ha egeghi kwa nti iwu-Ya. 25 O we wukwasi ya ọnuma nke iwe-Ya, na ike nke agha; nke ahu we suye ya ọku buruburu, ma ọ maghi; o we re ya ọku, ma ọ dighi-atughari obi-ya na ya.

Aisaia 43

1 Ma ub͕u a, otú a ka Jehova siri, bú Onye kèworo gi, Jekob, Nke kpuwo-kwa-ra gi, Israel: Atula egwu, n'ihi na ab͕aputawom i; akpọwom i n'aha-gi, nkem ka i bu. 2 Mb͕e i nāgabiga nime miri, gi ka M'gānọyere; mb͕e i nāgabiga nime osimiri, ha agaghi-erùchapu gi: mb͕e i nēje ije n'ọku, ọku agaghi-aru gi; ire-ọku agaghi-ere kwa gi ọku. 3 N'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi, na Onye Nsọ nke Israel, na onye-nzọputa-gi; enyewom Ijipt ka ọ buru ihe-nb͕aputa-gi, enyewom Etiopia na Seba n'ọnọdu gi. 4 Ebe i ghọworo ihe di oké ọnu-ahia n'anyam, ebe asọpuruwo-kwa-ra gi, ebe Mu onwem huwokwara gi n'anya; ya mere M'gēnye madu n'ọnọdu gi, nye kwa ndi di iche iche n'ọnọdu ndu-gi. 5 Atula egwu; n'ihi na gi ka M'nọyere: M'gēme ka nkpuru-gi si n'Ọwuwa-anyanwu bia, M'gēsi kwa n'Ọdida-anyanwu chikọta gi; 6 M'gāsi Ugwu, Nye; si kwa Ndida, Eb͕ochila: me ka umum ndikom si n'ebe di anya bia, gi me kwa ka umum ndinyom si na nsọtu uwa bia; 7 onye ọ bula nke anākpọ n'aham, nke M'kèwo-kwa-ra nye nsọpurum; akpuwom ya; e, emewom ya. 8 Me ka ndi kpuru ìsì nwere anya abua puta, ha na ndi nti chiri ma ha nwere nti. 9 Achikọtawo mba nile n'otù, kpọkọta kwa ndi nile di iche iche: ònye n'etiti ha gēgosi nka, me ka ayi nuru ihe mbu nile? Ka ha weputa ndi-àmà-ha, ka ewe gua ha na ndi ezi omume: ma-ọbu ka ha nuru, si, Ezi-okwu. 10 Unu onwe-unu bu ndi-àmàm, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, na orùm nke M'rọputara: ka unu we mara, kwerem, ghọta na Mu onwem bu Onye ahu: ọ dighi chi ọzọ eburu Mu onwem uzọ kpu, ma ọ bu nke gēsom n'azu. 11 Mu onwem, ọbuná Mu onwem, bu Jehova; ọ dighi kwa onye-nzọputa di ma-ọbughi náním. 12 Mu onwem egosiwo, zọputa kwa, me kwa ka anuru, ọ dighi kwa chi ala ọzọ di n'etiti unu: unu onwe-unu bu kwa ndi-àmàm, Ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, Mu onwem bu kwa Chineke. 13 Ọzọ, site n'ubọchi ta Mu onwem bu Ya; ọ dighi kwa onye nānaputa n'akam: anamalu ọlu, ònye gēme kwa ka ọ laghachi azu? 14 Otú a ka Jehova siri, bú onye-nb͕aputa-unu na Onye Nsọ nke Israel: n'ihi unu ka M'ga-eziga ozi na Babilon, M'gēme kwa ka ha rida dika ndi-ọ̀só, ha nile, ọbuná ndi Kaldea, n'ugbọ nile nke iti-nkpu-ọṅù-ha. 15 Mu onwem bu Jehova, Onye Nsọ unu, na Onye kèworo Israel, na Eze-unu. 16 Otú a ka Jehova siri, bú Onye ahu Nke nākwa uzọ n'oké osimiri na okporo-uzọ nime miri di ike; 17 Nke nēme ka ub͕ọ-ala na inyinya na usu-ndi-agha na dìnkpà puta; n'otù ka ha nēdinakọta, ha agaghi-ebili; ha anyu a, dika ogho-oriọna ka emenyuworo ha emenyu: 18 Unu echetala ihe mbu nile, unu atughari-kwa-la ihe nile nke mb͕e ochie n'obi. 19 Le, anameme ihe ọhu; ub͕u a ka ọ gēpú; ùnu agaghi-ama ya? e, M'gēme ka uzọ di n'ọzara, me kwa ka osimiri di iche iche di n'ala tọb͕ọrọ n'efu. 20 Anu ọhia gāsọpurum, bú nkita-ọhia na enyi-nnunu: n'ihi na enyewom miri n'ọzara na osimiri di iche iche n'ala tọb͕ọrọ n'efu, ime ka ndim ṅua, bú ndi M'rọputara: 21 ndi M'kpuworo nye Onwem, akukọ otutom ka ha gākọ. 22 Ma ọ bughi Mu ka i kpọkuworo, Jekob; kama ikem agwuwo gi, Israel. 23 I kpughi aturu nke àjà-nsure-ọku-gi nile biakutem; i jighi kwa àjà-gi nile sọpurum. Ejighm onyinye-inata-iru-ọma me ka i fè òfùfè, ejighkwam frankincense me ka ike gwu gi. 24 I jighi ego zutaram uda calamus, i jighi kwa abuba nke àjà-gi nile me ka afọ jubigam ókè: kama i jiwo nmehie-gi nile me ka M'fè òfùfè, i jiwo ajọ omume-gi nile me ka ike gwum. 25 Mu onwem, ọbuná Mu onwem, bu Onye ahu Nke nēchichapu njehie-gi nile n'ihi Mu onwem; M'gaghi-echeta kwa nmehie-gi nile. 26 Chetaram; ka ayi kpekọ ikpe: gi onwe-gi kọ akukọ-gi, ka ewe gua gi n'onye ezi omume. 27 Nna-gi mbu mehiere, ndi-nsughari-gi ejehiewo kwa megidem. 28 M'gēme kwa ndi-isi di nsọ ka ha ghara idi nsọ, nye kwa Jekob ka ọ buru ihe ewezugara ka ebibie ya, nye kwa Israel ka ọ buru ihe-nkwulu.

Aisaia 44

1 Ma ub͕u a, nuru, Jekob, bú orùm; nuru kwa, Israel, nke M'rọputara: 2 Otú a ka Jehova siri, bú Onye kèworo gi, Onye kpuwo-kwa-ra gi site n'afọ nne-gi, Nke nēyere gi aka; Atula egwu, gi orùm, bú Jekob; na gi, Jeshurum, nke M'rọputara. 3 N'ihi na M'gāwukwasi miri n'aru onye akpiri nākpọ nku, na ọtutu miri-iyi n'ala-akọrọ: M'gāwukwasi Mọm n'aru nkpuru-gi, na ngọzim n'aru umu i muru: 4 ha ewe pue n'etiti ahihia, dika osisi willow n'akuku iyi juputara na miri. 5 Otù onye gāsi, Onye Jehova nwere ka m'bu; onye ọzọ gākpọ onwe-ya n'aha Jekob; onye ọzọ gēdekwasi n'aka-ya, Onye Jehova nwere, ọ gēji kwa aha Israel tue onwe-ya aha. 6 Otú a ka Jehova, Nke bu eze Israel na onye-nb͕aputa-ya, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, siri: Mu onwem bu onye mbu, Mu onwem bu kwa onye ikpe-azu; ọ dighi kwa Chineke ọ bula di ma ewezuga nání Mu onwem. 7 Ọ̀ bu kwa onye, dika Mu onwem, nākpọ, nēgosi ya, nēdorom ya n'usoro, site na mb͕e M'doro ndi nke mb͕e ebighi-ebi gara aga? ihe nile nke gādi n'iru, na nke gābia, ka ha gosi ha. 8 Unu atula oké egwu, unu ama-kwa-la jijiji: ọ̀ bughi site na mb͕e gara aga ka M'meworo ka i nuru, gosi kwa gi ya? unu onwe-unu bu kwa ndi-àmàm. Ọ̀ di Chineke ọzọ di ma ewezuga nání Mu onwem? é-è, ọ dighi Oké Nkume ọ bula di; ọ dighi otù efu M'mara. 9 Ndi n-akpu arusi apiri api, ha nile bu ihe tọb͕ọrọ n'efu; ihe nile anāchọsi nke ha agaghi-aba urù: ndi-àmà-ha kwa, ha onwe-ha adighi-ahu uzọ, ha adighi-ama kwa; ka ihere we me ha. 10 Ònye kpuworo chi, ma-ọbu wua arusi apiri api nke nābaghi urù ma-ọli? 11 Le, ihere gēme ndi ejikọtara ya na ha; ndi-ọ̀kà kwa, ha onwe-ha bu ihe zara madu: ka ha chikọta onwe-ha, ha nile, ka ha ọtọ; ha gātu oké egwu, ihere gēme ha n'otù. 12 Uzú nākpu ihe-ọlu, o were icheku alu, were kwa otùtù-ya nile akpu ya, were kwa ogwe-aka-ya di ike alu ya: ọzọ, agu nāgu ya, ike we ghara idi; ọ ṅughi miri, o we da #mbà. 13 Onye-ọ̀kà n'osisi nēseti eriri; ọ nēwere pencil kà ya; o were nkpu-ya nile akpucha ya, were kwa compass-ya kà ya, o we me ya ka ọ di ka ihe-atù nwoke, dika ima-nma nke madu, ibi n'ulo. 14 Ọ nēb͕uturu onwe-ya osisi cedar di iche iche, were kwa osisi holm na osisi oak, ọ nēme-kwa-ra onwe-ya otù osisi nētiti osisi nile nke oké ọhia ka o nwe ume: ọ kuwo osisi fir, miri-ozuzo nēme kwa ka o bùe ibù. 15 Ọ gābu-kwa-ra madu ihe isure ọku; o we were ufọdu nime ha, nya ọku; e, ọ funwue ya, we sie achicha: e, ọ nāpi chi, we kpọ isi ala nye ya; o mewo ya arusi apiri api, we da kpue iru n'ala n'iru ya. 16 Nkera-ya ka o sureworo n'ọku; o ji nkera-ya eri anu; ọ nāru anu-ọruru, we rijue afọ: e, ọ nānya ọku we si, Ehe, aru ekpowom ọku, ahuwom ọku: 17 ma nke fọduru nime ya ka o meworo ka ọ ghọ chi, ọbuná arusi ya-akiri-api: ọ nāda kpu iru n'ala n'iru ya, nākpọ kwa isi ala, nēkpere ya, si Naputam; n'ihi na chim ka i bu. 18 Ha amaghi, ha adighi-aghọta kwa: n'ihi na O techiwo anya-ha, ha we ghara ihu uzọ; O techiwo obi-ha, ha we ghara inwe uche. 19 Ọ dighi kwa onye nēchetara obi-ya, ọ dighi kwa ihe-ọmuma maọbu nghọta di isi, Nkera-ya ka m'sureworo n'ọku; ọzọ kwa, esiwom achicha n'elu icheku-ọku-ya nēre ere; anamaru anu rie: #m'gēme kwa nke fọduru nime ya ka ọ ghọ ihe-árú? ọ̀ bu n'iru ogwe osisi ka m'gāda kpue iru n'ala? 20 Ọ bu onye ji ntu azù onwe-ya: obi akwara emò ewezugawo ya, o we ghara inaputa nkpuru-obi-ya, ma ọbu isi, Ọ̀ bughi okwu-ugha, bú ihe di n'aka-nrim? 21 Cheta ihe ndia, Jekob; gi Israel kwa, n'ihi na orùm ka i bu: akpuwom i; orù M'nwere ka i bu: Israel, M'gaghi-echezọ gi. 22 Ehichapuwom njehie-gi nile, dika oké igwe-oji, hichapu kwa nmehie-gi nile, dika igwe-oji: Iaghachikutem; n'ihi na ab͕aputawom i. 23 Tienu nkpu ọṅù, unu elu-igwe, n'ihi na Jehova emewo ya; tienu nkpu, unu ebe nile di ala nke uwa; unu ugwu, tibenu nkpu ọṅù, gi oké ọhia, na osisi ọ bula di nime ya: n'ihi na Jehova ab͕aputawo Jekob, ọ bu kwa n'Israel ka Ọ gēme Onwe-ya ka Ọ ma nma. 24 Otú a ka Jehova siri, bú Onye-nb͕aputa-gi na Onye kpuworo gi site n'afọ nne-gi: Mu onwem bú Jehova, Onye nēme ihe nile; Onye náním nēseti elu-igwe; Onye nāb͕asa uwa; ọ̀ bu onye ka Mu na ya nọ? 25 abum Onye nēmebi ihe-iriba-ama nile nke ndi-ekwukwu, M'nēme kwa ka ndi nāju ase wi ara; abum Onye nēme ka ndi mara ihe laghachi azu, M'nēme kwa ka ihe-ọmuma-ha ghọ ihe-nzuzu: 26 abum Onye nēme ka okwu orù-Ya guzosie ike, Nke nēmezu kwa ndum-ọdu ndi-ozi-Ya; Onye ahu Nke nēkwu okwu bayere Jerusalem, si, Agēbi ya; Nke nēkwu kwa okwu bayere obodo nile nke Juda, si, Agēwu ha; nkpọnkpọ-ebe-ya nile ka M'gēwuli kwa: 27 Onye ahu Nke nāsi ob͕u-miri, Takọ; osimiri-gi nile ka M'gēme kwa ka ha tachasia: 28 Onye ahu Nke nēkwu okwu bayere Sairọs, si, Ọ bu onye-ọzùzù-aturum, ihe nile nke nātọm utọ ka ọ gēmezu kwa: ọbuná n'ikwu okwu bayere Jerusalem, si, Agēwu ya; na n'isi ulo uku Chineke, Agātọ ntọ-ala-gi.

Aisaia 45

1 Otú a ka Jehova siri onye-Ya etere manu, bú Sairọs, onye M'jideworo aka-nri-ya, izọda mba di iche iche n'iru ya, ọ bu kwa úkwù ndi-eze ka M'gēkepu; imeghe uzọ n'iru ya, agaghi-emechibido kwa ọnu-uzọ-ama; 2 Mu onwem gāga n'iru-gi, me ka nkputankpu ebe nile guzozie: ibo-ọnu-uzọ ọla nile ka M'gētiwa, ihe-ntuchi ígwè nile ka M'gēb͕ujipu kwa: 3 M'gēnye kwa gi àkù nke ọchichiri, na àkù zoro ezo nke ebe nzuzo di iche iche, ka i we mara na Mu onwem, Jehova, bu Onye ahu Nke nākpọ gi n'aha-gi, ọbuná Chineke Israel. 4 N'ihi orùm, bú Jekob, na Israel nke M'rọputara, ka M'nākpọ gi n'aha-gi: anametu gi aha, ọ bu ezie na i maghm. 5 Mu onwem bu Jehova, ọ dighi kwa onye ọzọ di; ma ewezuga náním ọ dighi Chineke ọ bula di: M'nēke gi ihe-ọkiké n'úkwù, ọ bu ezie na i maghm: 6 ka ha we mara site n'ọwuwa anyanwu, site kwa n'Ọdida-anyanwu, na ọ dighi otù Chineke efu di ma-ọli ma ewezuga náním: Mu onwem bu Jehova, ọ dighi kwa onye ọzọ di. 7 Abum Onye nākpu ìhè na Onye nēkè ọchichiri; abum Onye nēme udo na Onye nēkè ihe ọjọ: Mu onwem bu Jehova, Onye nēme ihe ndia nile. 8 Unu elu-igwe, nātasinu ezi omume site n'elu, ka mbara-ígwé nile nēzoda kwa ezi omume dika miri: ka ala meghe onwe-ya, ka ha we mia nzọputa dika nkpuru, ka o me kwa ezi omume ka ọ pukọ n'otù; Mu onwem, bú Jehova, ekèwo ya. 9 Ahuhu gādiri onye nāluso Onye kpuworo ya ọ̀gù! otù ejùjù nile nke ala! Urọ, ọ̀ gāsi onye nākpu ya, Gini ka i nālu? ma-ọbu ọlu-gi, ọ̀ gasi, Ọ dighi aka abua o nwere? 10 Ahuhu gādiri onye nāsi nna-ya, Gini ka i nāmu? nke nāsi kwa nwanyi, Ìme gini nēme gi? 11 Otú a ka Jehova siri, bú Onye Nsọ nke Israel na Onye kpuworo ya: Juanum ajuju bayere ihe nile nābia; nyenum iwu bayere umum, ma-ọbu bayere ọlu akam abua. 12 Mu onwem emewo uwa, kè kwa madu n'elu ya: Mu onwem, akam abua setiri elu-igwe, ọ bu usu nile nke ihe-ha M'nyeworo iwu. 13 Mu onwem akpọtewo ya n'ezi omume, ọ bu kwa uzọ-ya nile ka M'gēme ka ha guzozie: onye ahu gēwu obodom, zilaga ndim emereri ka ha je biri n'ala ọzọ, ọ bughi n'ihi ọnu-ahia, ọ bughi kwa n'ihi iri-ngo, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri. 14 Otú a ka Jehova siri, Ihe putara na ndọb͕u Ijipt nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, na ọzuzu-ahia nke Etiopia, na ndi Saba, ndi toro ogologo, gāgabigakute gi, ndi i nwere ka ha gābu kwa; gi ka ha gēso n'azu; na nkpọrọ ka ha gāgabiga: ọ bu kwa gi ka ha gākpọ isi ala nye, gi ka ha gēkpere, si, N'ezie nime gi ka Chineke nọ; ọ dighi kwa onye ọzọ di, ọ dighi otù Chineke efu di ma-ọli. 15 N'ezie Gi onwe-gi bu Chineke Nke nēzobe Onwe-gi, Gi Chineke Israel, bú Onye-nzọputa. 16 Ihere emewo ha, e, etiyewo kwa ha n'ọnọdu-ihere, ha nile: n'otù ka ha lakọworo n'ọnọdu-ihere, bú ndi-ọ̀kà nēb͕u arusi eb͕uru eb͕ubu. 17 Jehova ejiwo nzọputa ebighi-ebi zọputa Israel: ihere agaghi-eme unu, agaghi-etiye kwa unu n'ọnọdu-ihere rue mb͕e nile ebighi-ebi. 18 N'ihi na otú a ka Jehova Nke kèworo elu-igwe siri; Ya onwe-ya bu Chineke: Onye kpuworo uwa, me ya; Ya onwe-ya mere ka o guzosie ike, ọ bughi ihe tọb͕ọrọ n'efu ka Ọ kère ya, ọ bu ka ewe biri nime ya ka Ọ kpuru ya: Mu onwem bu Jehova; ọ dighi kwa Chineke ọzọ di. 19 Ọ bughi na nzuzo ka M'kwuworo okwu, n'otù ebe nke ala ọchichiri; asighm nkpuru Jekob, Chọnum n'ebe tọb͕ọrọ n'efu: Mu onwem bu Jehova, Onye nēkwu ezi omume, Onye nēgosi ihe di iche iche ziri ezi. 20 Chikọtanu onwe-unu, bia; biarunu nso n'otù, unu ndi mba nile b͕aputara ab͕aputa: ha amaghi ama, bú ndi ahu nēbu osisi arusi-ha apiri api, ndi nēkpe-kwa-ra chi nādighi-azọputa. 21 Gosinu, weta-kwa-nu ha nso; e, ka ha b͕akọ ìzù n'otù: ònye mere ka anu ihe a site na mb͕e gara aga? onye sitere na mb͕e ochie gosi ya? ọ̀ bughi Mu onwem, bú Jehova? ọ dighi kwa Chineke ọzọ di ma ewezuga nání Mu onwem; Chineke Nke nēme ezi omume na onye-nzọputa adighi ma ewezuga nání Mu onwem. 22 Chenum iru, ewe zọputa unu, unu nsọtu nile nke uwa: n'ihi na Mu onwem bu Chineke, ọ dighi kwa Chineke ọzọ di. 23 Ejiwom Onwem ṅua iyi, otù okwu esiwo n'ọnum puta n'ezi omume, ọ gaghi-alaghachi kwa, si, na Mu onwem ka ikperè nile ọ bula gēb͕uru, Mu ka ire nile ọ bula gāṅuru iyi. 24 Nání na Jehova ka ezi omume nile na ike di, (mu ka agwara okwu a): Ya ka madu gābiakute, ihere gēme kwa ndi ahu nile iwe-ha di ọku megide Ya. 25 Na Jehova ka agāgu nkpuru nile nke Israel na ndi ezi omume, ọ bu kwa na Ya ka ha gānya isi.

Aisaia 46

1 Bel eruruwo ala, Nebo amakpuwo amakpu; arusi nile ha di n'elu anumanu na n'elu anu-ulo: ihe nile unu nēbughariri bu ibu eboro ebo, ha bu ibu eboro anu nāda #mbà. 2 Ha amakpuwo, ruru ala n'otù; ha apughi ime ka ibu wezuga onwe-ya, kama ha onwe-ha alawo na ndọta-agha. 3 Genum nti, unu uio Jekob, na ulo Israel nile fọduru afọdu, unu ndi bu ibu eboro ebo site n'afọ nne-unu, ndi eburu ebu site n'àkpà-nwa: 4 ọzọ, rue agadi Mu onwem bu Onye ahu, ru kwa isi-awọ Mu onwem gēku unu n'aka: Mu onwem emewo, Mu onwem gēbu kwa; e, Mu onwem gēku n'aka me kwa ka unu wepuga onwe-unu. 5 Ònye ka unu gasi na M'yiri ya, na Mu na ya rara nrata, na Mu di ka ya, ka ayi we yie? 6 Ndi ahu ndi nāwufu ọla-edo n'akpa, ndi nātù kwa ọla-ọcha n'ihe-ọtùtù, ha nēgota onye-nnucha-ọla, o we me ya ka ọ buru chi: ha nāda kpu iru n'ala, e, ha nākpọ isi ala. 7 Ha nēbuli ya n'ubu, n'ebu ya, we dọba ya n'ọnọdu-ya, o we guzo; ọ gaghi-esi n'ebe-ya pua: e, madu gētiku ya nkpu, ma ọ gaghi-aza, ọ gaghi-azọputa ya n'ahuhu-ya. 8 Chetanu nka, jisi-kwa-nu ike: menu ka ọ biaghachi n'obi, unu ndi-njehie. 9 Chetanu ihe mbu nile site na mb͕e ebighi-ebi gara aga: n'ihi na Mu onwem bu Chineke, ọ dighi kwa Chineke ọzọ di; abum Chineke, ọ dighi kwa otù efu di ka Mu onwem; 10 nēgosi ikpe-azu site na mbu, nēgosi kwa ihe nke anēmeghi eme site na mb͕e ochie; nāsi, Ndum-ọdum gēguzosi ike, ọ bu kwa ihe nile nke nātọm utọ ka M'gēme: 11 nēsi n'ọwuwa-anyanwu kpọ udele, nēsi kwa n'ala di anya kpọ onye gēme ndum-ọdum: e, ekwuwom, M'gēme kwa ka o me; ezubewom, M'gēme kwa ya. 12 Genum nti, unu ndi di ike n'obi, ndi nọpuru ezi omume n'ebe di anya: 13 Ewetawom ezi omumem nso, ọ gaghi-adi n'ebe di anya, nzọputam agaghi-anọ kwa ọdù; M'we nye nzọputa nime Zaion, nye kwa Israel ima-nmam.

Aisaia 47

1 Rida, we nọdu n'ájá, gi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú ada Babilon; nọdu n'ala ghara inwe oche-eze, gi ada ndi Kaldea: n'ihi na i gaghi-abu kwa onye ha nākpọ nwanyi di nrò nke di kwa pekepeke. 2 Were nkume-igwe-nri gwe utu ọka: kpupu ákwà-nkpuchi-gi, yipu uwe-nwuda-gi, kpughepu ogwe-ukwu-gi, gabiga osimiri di iche iche. 3 Agēkpughe ọtọ-gi, e, agāhu ita-uta-gi: ọ́bọ̀ ka M'gābọ̀, M'gaghi-ezute madu. 4 Onye-nb͕aputa-ayi, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya, bú Onye Nsọ nke Israel. 5 Nọdu du, ba n'ọchichiri, gi ada ndi Kaldea: n'ihi na i gāghi-abu onye ha nākpọ, Nwanyi-nwe ala-eze di iche iche. 6 Ewesaram ndim iwe, emerem ihe-nketam ka ọ ghara idi nsọ, M'we nye ha n'aka-gi: i nweghi obi-ebere n'aru ha; n'aru agadi ka i meworo ka yoke nke gi di arọ́ nke-uku. 7 I we si, Rue mb͕e ebighi-ebi ka m'gabu nwanyi-nwenu: i we ghara itukwasi ihe ndia n'obi-gi, i chetaghi ikpe-azu-ya. 8 Ma ub͕u a nuru nka, gi nwanyi nēme ka o si tọ gi utọ, gi onye nānọ na ntukwasi-obi, nke nāsi n'obi-gi, Mu onwem nọ, ọ dighi kwa otù efu ọzọ di ma ewezuga nání mu onwem; m'gaghi-anọ dika nwanyi di-ya nwuru, m'gaghi-ama kwa ọb͕ub͕a-aka-umu: 9 ma ihe abua ndia gābiakute gi n'otù ntabi-anya n'otù ubọchi, bú ọb͕ub͕a-aka-umu na ọnọdu nwanyi di-ya nwuru: dika izu-okè-ha si di ka ha biakwasiworo gi, n'ọtutu mb͕asi-gi, na n'inwebiga-ume-ókè nke ọlu dibia-nrafu nile i nālu. 10 I we tukwasi obi n'ihe ọjọ gi; i siwo, Ọ dighi onye nāhum; amam-ihe-gi na ihe-ọmuma-gi, nke ahu emewo ka i laghachi azu: i we si n'obi-gi, Mu onwem nọ, ọ dighi kwa otù efu ọzọ di ma ewezuga nání mu onwem. 11 Ma ihe ọjọ abiakwasiwo gi; i gaghi-ama chi-ọbubọ di ya: nbibi gādakwasi kwa gi; i gaghi-enwe ike ikpuchi anya-ya: ila-n'iyì gābiakwasi kwa gi na mberede, nke i nāmaghi. 12 Biko, guzo n'ọlu dibia-nrafu nile i nālu, na n'ọtutu mb͕asi-gi, nke i dọb͕uworo onwe-gi n'ọlu nime ha site na mb͕e i nọ na nwata; eleghi anya i gēnwe ike ibà urù, eleghi anya i geme ka madu ma jijiji. 13 Ike agwuwo gi n'ọtutu ndum-ọdu-gi: biko, ka ha guzo ọtọ, we zọputa gi, bú ndi nēkè elu-igwe, ndi nēlegide kpakpando, ndi nēme ka amara kwa-ọnwa ihe gēme, n'ihe gābiakwasi gi. 14 Le, ha di ka ahihia-ọka kpọrọ nku; ọku erewo ha; ha agaghi-anaputa onwe-ha n'aka ire ọku: ọ bughi icheku-ọku nēre ere iji nya ọku, ọ bughi kwa ọku inọdu n'iru ya. 15 Otú a ka ha diri gi, bú ihe nke i dọb͕uworo onwe-gi n'ọlu nime ha: ndi gi na ha nāzu ahia site na mb͕e i di na nwata awaghariwo, onye ọ bula rue ofè nke ya; ọ dighi onye nāzọputa gi.

Aisaia 48

1 Nurunu nka, unu ulo Jekob, ndi anākpọ n'aha Israel, ndi siwo-kwa-ra na miri Juda puta; ndi ji aha Jehova aṅu iyi, ọ bu kwa Chineke Israel ka ha nēhota, ma ọ bughi n'ezi-okwu, ọ bughi kwa n'ezi omume. 2 N'ihi na ha akpọwo onwe-ha ndi sitere n'obodo nsọ, ọ bu kwa Chineke Israel ka ha dabereworo; Jehova usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya. 3 Ihe mbu nile site na mb͕e ochie ka M'gosiworo; ọ bu kwa n'ọnum ka ha siri puta, M'we meka anu ha: na mberede ka M'mere ha, ha we me. 4 N'ihi na M'mara na onye siri ike ka i bu, na ọ bu akwara ígwè ka olu-gi bu, na egedege-iru-gi bu kwa ọla; 5 M'we gosi gi ya site na mb͕e ochie; tutu o me emerem ka i nuru: ka i we ghara isi, Arusim emewo ha, ọ bu kwa arusim apiri api na arusim awuru awu nyere ha iwu. 6 I nuwo ya; gi le ihe a nile; unu onwe-unu kwa, ùnu agaghi-egosi ya? Emewom ka i nuru ihe ọhu di iche site n'ub͕u a, bú ihe echebeworo na nzuzo, nke i nāmaghi. 7 Ub͕u a ka ekèworo ha, ọ bughi site na mb͕e ochie; ọzọ, tutu ubọchi ta erue i nughi kwa ha; ka i we ghara isi, Le, amaram ha. 8 Otú ọ di, i nughi; i maghi kwa; site kwa na mb͕e ochie nti-gi egheghi oghe: n'ihi na amaram na i nāghọb͕u nke-uku, ọzọ, Onye nējehie ejehie site n'afọ nne-ya, ka anākpọ gi. 9 N'ihi aham ka M'nēme ka iwem nọ ọdù, ọ bu kwa n'ihi otutom ka M'nēb͕ochi ya n'ebe i nọ, ka M'we ghara ibipu gi. 10 Le, anuchawom i, ma ọ bughi dika ọla-ọcha; arọputawom i n'oké ọku nke iweda-n'ala. 11 N'ihi Mu onwem, n'ihi Mu onwem, ka M'gēme ya; n'ihi na le ka esi me ka aham ghara idi nsọ nke-uku! M'gaghi-enye kwa onye ọzọ nsọpurum. 12 Gem nti, Jekob, na Israel, bú onye M'kpọworo: Mu onwem bu Onye ahu; Mu onwem bu onye mbu, Mu onwem bu kwa onye ikpe-azu. 13 E, akam atọwo ntọ-ala uwa, ọ bu kwa aka-nrim setipuworo elu-igwe: ọ buru na Mu onwem akpọ ha gēguzo ọtọ n'otù. 14 Chikọtanu onwe-unu, unu nile, nuru kwa; ònye n'etiti ha gosiworo ihe ndia? Onye ahu Jehova huworo n'anya gēme ihe nātọ Ya utọ na Babilon, ọ bu kwa ogwe-aka-ya gādakwasi ndi Kaldea. 15 Mu onwem, ọbuná Mu onwem, ekwuwo okwu; e, akpọwom ya: emewom ka ọ bia, ọ gēme kwa ka ije-ya ga nke-ọma. 16 Biakutenum nso, nurunu nka; site na mb͕e mbu ọ bughi na nzuzo ka M'kwuworo okwu; site na mb͕e ọdidi-ya, n'ebe ahu ka M'nọ: ma ub͕u a Onye-nwe-ayi Jehova ezitewom, mu na Mọ-Ya. 17 Otú a ka Jehova siri, bú Onye-nb͕aputa-gi na Onye Nsọ Israel: Mu onwem bu Jehova, Chineke-gi, Onye nēzí gi ime ihe nābà úrù, Onye nēme ka i zọ ije n'uzọ i gējeso. 18 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na i ṅarari nti n'ihe nile M'nyere n'iwu! udo-gi ewe diwori ka osimiri, ezi omume-gi adi kwa ka nmali-miri nile nke oké osimiri: 19 nkpuru-gi gādiwo-kwa-ri ka ájá, umu nke si n'afọ-gi puta di ka umu-ihe si n'afọ oké osimiri ahu puta: agaghi-ebipuwori aha-ya ma-ọbu kpochapu ya n'irum. 20 Sinu na Babilon pua, b͕anarinu ndi Kaldea; werenu olu nke iti-nkpu-ọṅù gosi, me ka anuru nka, menu ka ọ puta ìhè rue nsọtu uwa: sinu, Jehova ab͕aputawo orù-Ya, bú Jekob. 21 Akpiri akpọghi ha nku mb͕e O mere ka ha je ije n'ala kpọrọ nku: O mere ka miri si n'oké nkume rùputara ha: e, Ọ kpọwara oké nkume, miri we suputa. 22 Ọ dighi udo diri ndi nēmebi iwu, ka Jehova siri.

Aisaia 49

1 Genum nti, unu agwe-etiti; ṅa-kwa-nu nti, unu ndi di iche iche, site n'ebe di anya: Jehova esitewo na mb͕e m'nọ n'afọ kpọm; site na mb͕e m'nọ n'afọ nnem ka O hotaworo aham: 2 O we me ka ọnum di ka mma-agha di nkọ, na ǹdò aka-Ya ka O zobeworom; O we me ka m'ghọ àmùmà, n'àkpà-àkú-Ya ka O zebeworom: 3 O we sim, Orùm ka i bu; gi Israel, onye ọ bu nime gi ka M'gēme Onwem ka M'ma nma. 4 Ma mu onwem siri, N'efu ka m'dọb͕uworo onwem n'ọlu, n'ihi ihe tọb͕ọrọ n'efu na otù nku-ume ka m'meworo ka ikem gwusia: n'ezie ikpém di n'aka Jehova, ugwọ-ọlum di kwa n'aka Chinekem. 5 Ma ub͕u a Jehova siri, bú Onye kpuworom site n'afọ nnem iburu Ya orù, ime ka Jekob laghachikute Ya, ka ewe chikọta-kwa-ra Ya Israel: (anāsọpu-kwa-ram n'anya Jehova, Chinekem aghọwo ikem: ) 6 O we si, Ọ bu ihe di kari nfe na i gāburum orù, ime ka ebo nile nke Jekob bilie, na ime ka ndi Israel echebere echebe lata: enyewokwam i ka i buru ìhè nke mba nile, ibu nzọputam rue nsọtu uwa. 7 Otú a ka Jehova, bú Onye-nb͕aputa Israel na Onye Nsọ ya, siri onye madu nēleda, onye bu ihe-árú nke mba nka, onye bu orù ndi nāchi achi: Ndi-eze gāhu, we kpọ isi ala; n'ihi Jehova Nke kwesiri ntukwasi-obi, bú Onye Nsọ nke Israel, Nke rọputaworo gi. 8 Otú a ka Jehova siri, Na mb͕e ihe madu nātọm utọ ka M'zaworo gi, ọ bu kwa n'ubọchi nzọputa ka M'nyeworo gi aka: M'gēchebe kwa gi, nye gi ka i buru ọb͕ub͕a-ndu nke ndim, ime ka ala bilie, ime ka ha keta ihe-nketa nile tọb͕ọrọ n'efu; 9 nāsi ndi ekere ab͕u, Puanu; nāsi ndi nọ n'ọchichiri, Putanu n'ìhè. N'uzọ nile ka ha gāzù onwe-ha, ọ bu kwa n'ugwu nile ọhia nādighi ka ebe-ita-nri-ha gādi. 10 Agu agaghi-agu ha, akpiri agaghi-akpọ kwa ha nku; miri na anyanwu agaghi-amab͕u kwa ha: n'ihi na Onye nwere obi-ebere n'aru ha gēdu ha, ọ bu kwa n'akuku isi-iyi nile juputara na miri ka O gēdu ha nwayọ. 11 M'gēme kwa ka ugwum nile ghọ uzọ, agēme kwa ka uzọm nile atuliri atuli di elu. 12 Le, ndia gēsi n'ebe di anya bia: le kwa, ndia gēsi n'Ugwu na n'Ọdida-anyanwu; ndia gēsi kwa n'ala Sainim. 13 Tienu nkpu ọṅù, unu elu-igwe; tegharia egwú ọṅù, gi uwa; tiwanu nkpu ọṅù, unu ugwu: n'ihi na Jehova akasiwo ndi-Ya obi, Ọ gēnwe kwa obi-ebere n'aru ndi-Ya ewedara n'ala. 14 Ma Zaion siri, Jehova arapuwom, Onye-nwe-ayi echezọwokwam. 15 Nwanyi, ọ̀ gēchezọ nwa-ya nāṅu ara, we ghara inwe obi-ebere n'aru nwa afọ-ya? e, eleghi anya ndia gēchezọ, ma Mu onwem agaghi-echezọ gi. 16 Le, n'ọbu-akam abua ka M'kàworo gi àkà; mb͕idi-gi nile di n'irum mb͕e nile. 17 Umu-gi emewo ngwa; ndi nākwada gi na ndi nēme ka i tọb͕ọrọ n'efu gēsi nime gi pua. 18 Welie anya-gi abua le buruburu, we hu: ndia nile achikọtawo onwe-ha, biakute gi. Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, ) n'ezie ha nile ka i gēyiri dika ihe-ichọ-nma, were ha ke, dika nwunye ọhu. 19 N'ihi na, nkpọnkpọ ebe-gi nile na ebe-gi nile tọb͕ọrọ n'efu na ala-gi akwadara akwada, n'ezie ub͕u a i gādikara ndi bi n'ala nkpà, ndi nēloda gi gānọ kwa n'ebe di anya. 20 Umu nke mb͕e ọb͕ub͕a-aka-umu-gi gāsi kwa na nti-gi abua ọzọ, Ebe a dim nkpà: nyem ọnọdu ka m'we biri. 21 I gāsi kwa n'obi-gi, Ònye muru ndia nyem, ebe mu onwem bu onye ab͕abaworo aka umu, na nwanyi-àgà, na onye emeworo ka ọ je biri n'ala ọzọ, na onye ewezugara ewezuga? ma ndia, ònye mere ka ha toputa? Le, mu onwem fọduru, náním; ndia, òle ebe ha nọ? 22 Otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova, siri, Le, M'gēweliri mba nile akam, ọ bu kwa ndi di iche iche ka m'gēbuliri ọkọlọtọm: ha gēkuta kwa umu-gi ndikom n'obi-ha, agēbu kwa umu-gi ndinyom n'ubu-ha. 23 Ndi-eze gābu kwa nna nāzù umu-gi, ndi-eze-nwanyi-ha gābu kwa ndinyom nēnye umu-gi ara: ha gākpọ isi ala nye gi, kpue iru-ha n'ala, racha ájá ukwu-gi abua; i we mara na Mu onwem bu Jehova, Onye ihere agaghi-eme ndi nēle anyam. 24 Àgānara dike ihe o wetara n'agha, ma-ọbu ndi onye ezi omume dọtara n'agha, àgēme ka ha wepuga onwe-ha? 25 Ma otú a ka Jehova siri, Ọbuná ndi dike dọtara n'agha ka agēwepu, ọzọ, ihe onye nēme ka madu ma jijiji wetara n'agha, agēme ya ka ọ wepuga onwe-ya; ọ bu kwa onye nāluso gi ọ̀gù, ọ bu kwa umu-gi ka Mu onwem gāzọputa. 26 M'gēme kwa ka ndi nēme gi ihe-ike rie anu-aru onwe-ha: ha gāṅubiga kwa ọbara onwe-ha ókè, dika ọ bu manya-vine ọhu: anu-aru nile, bú madu, ewe mara na Mu onwem, Jehova, bu Onye-nzọputa-gi, na Onye-nb͕aputa-gi, bú Onye di ike nke Jekob.

Aisaia 50

1 Otú a ka Jehova siri, Òle ebe akwukwọ nkwa nke nne-unu di, bú nke M'ji chupu ya? ma-ọbu ònye nime ndi M'nara ego n'ọmuru-nwa ka M'reworo unu n'aka ya? Le, ọ bu n'ihi ajọ omume nile nke unu ka erere unu, ọ bu kwa n'ihi njehie nile nke unu ka achupuru nne-unu. 2 Gini mere onye ọ bula adighi mb͕e M'biara? gini mere onye-ọziza adighi mb͕e M'kpọrọ òkù? ọ̀ bu na akam dikara nkpunkpu ma-ọli ib͕aputa? ma-ọbu ọ̀ dighi ike di nimem inaputa? Le, n'ibasi-nba-ikem anameme ka oké osimiri tasia, anameme osimiri ka ha ghọ ọzara: azù-ha nēsì ísì, n'ihi na miri adighi, we nwua n'akpiri-ikpọ-nku. 3 Ejim iji-nji yikwasi elu-igwe dika uwe, ọ bu kwa akwà-nkpe ka M'nēme ka ọ buru ihe-nb͕okwasi-ha. 4 Onye-nwe-ayi, bú Jehova, enyewom ire nke ndi-nmuta, ka m'we mara iwere okwu kwagide onye dara #mbà: Ọ nākpọte ntim kwa-ututu, Ọ nākpọte ntim inu ihe dika ndi-nmuta. 5 Onye-nwe-ayi Jehova emegheworom ntim, ma Mu onwem enupugh isi, alaghachighm azu. 6 Azum ka m'nyere ndi-oti-ihe, ǹtìm abua ka m'nyere ndi nēkwopu afu-ọnu: ezopughm irum n'ọnọdu-ihere anētiyem na ọbubú-ọnu. 7 Ma Onye-nwe-ayi Jehova nēyerem aka; n'ihi nka etiyeghm n'ọnọdu-ihere: n'ihi nka ka m'cheworo irum dika ọmú, ama-kwa-ram na ihere agaghi-emem. 8 Onye nāgum n'onye ezi omume di nso: ọdi onye mu na ya gēkpe? ka ayi guzo ọtọ n'otù: ònye bu onye ahu nwere okwu-ikpe ikwugidem? ya biakutem nso. 9 Le, Onye-nwe-ayi Jehova gēyerem aka: ònye bu onye ahu gāmam ikpe? le, ha nile gāka dika uwe; nla gērichapu ha. 10 Onye n'etiti unu bu onye nātu egwu Jehova, nēge nti n'olu orù-Ya? onye nke jeworo ije n'ọchichiri, nke ọ dighi onwunwu-ọku o nwere, ya tukwasi obi n'aha Jehova, dabere Chineke-ya. 11 Le, unu nile ndi nāmuye ọku, ndi ji àkú nēre ọku eke onwe-unu n'úkwù dika ihe-ọkiké: jegharinu n'ire ọku-unu, na n'etiti àkú nile nēre ọku unu funwuworo. Ihe a esitewo n'akam diri unu; n'ihe-nwuta ka unu gēdina ala.

Aisaia 51

1 Genum nti, unu ndi nāb͕aso ezi omume, ndi nāchọ Jehova: legidenu oké nkume anya nke esiri waputa unu, legide-kwa-nu ọnu olùlù nke esiri gwuputa unu. 2 Legidenu Abraham, bú nna-unu, legide kwa Sera nke muputara unu: n'ihi na -o bu mb͕e ọ bu nání otù onye ka M'kpọrọ ya, M'we gọzie ya, me ka ọ ba uba. 3 N'ihi na Jehova akasiwo Zaion obi: Ọ kasiwo nkpọnkpọ ebe-ya nile, me ka ọzara-ya di ka Iden, me ka ala-ya nke ihe nādighi di ka ubi Jehova ab͕ara ogige; obi-utọ na ọṅù ka agāhu nime ya, na ekele, na olu abù ọma. 4 Ṅanum nti, unu ndim; unu kwa mba nkem, gēnum nti: n'ihi na otù iwu gēsi n'ọnum puta, M'gēme kwa ka ikpém nwe ọnọdu ka ọ buru ìhè nke ndi nile. 5 Ezi omumem di nso, nzọputam aputawo, ogwe-akam abua gēkpe ndi nile ikpe; agwe-etiti nile gēle anyam, ọ bu ogwe-akam ka ha gēchere. 6 Welienu anya-unu le elu-igwe, legide-kwa-nu uwa di n'okpuru: n'ihi na elu-igwe gāpu n'anya dika anwuru-ọku, uwa gāka kwa nká dika uwe, ndi bi ya gānwu kwa dika anwu ntà: ma nzọputam gādiru mb͕e ebighi-ebi, agaghi-ebibi kwa ezi omumem. 7 Genum nti, unu ndi mara ezi omume, bú ndi ahu nke iwum di n'obi-ha; unu atula egwu ita-uta madu, unu atu-kwa-la ujọ nkwulu nile ha. 8 N'ihi na nla gērichapu ha dika uwe, aruru gērichapu kwa ha dika aji-anu: ma ezi omumem gādiru mb͕e ebighi-ebi, nzọputam gādiru kwa ọb͕ọ nile. 9 Teta, teta, yiri ike dika uwe, gi ogwe-aka Jehova; teta, dika n'ubọchi nile nke mb͕e ochie, bú ọb͕ọ nile nke mb͕e nile ebighi-ebi gara aga. Ọ̀ bughi gi onwe-gi bu ihe ahu nke kpọwasiworo Rehab, nke mapúworo ogologo anu-miri? 10 Ọ̀ bughi gi onwe-gi bu ihe ahu nke meworo ka oké osimiri tasia, bú miri nke ob͕u-miri riri nne; nke meworo ebe nile miri emi nke oké osimiri ka ọ ghọ uzọ ndi emeworo ka ha nwere onwe-ha gēsi gabiga? 11 Ndi Jehova ab͕aputara ab͕aputa gālata kwa, were iti-nkpu-ọṅù bata nime Zaion; ọṅù ebighi-ebi gādi kwa n'isi-ha: obi-utọ na ọṅù ka ha gābiarute, iru-újú na ize-ume ab͕alawo. 12 Mu onwem, ọbuná Mu onwem, bu Onye ahu nākasi unu obi; ònye ka i bu, na i nātu egwu madu gānwu anwu, na i nātu egwu nwa madu nke agēme ka ọ di ka ahihia; 13 i we chezọ Jehova Onye meworo gi, Onye nēseti elu-igwe, tọ kwa ntọ-ala uwa: i we tua oké egwu mb͕e nile ogologo ubọchi nile n'ihi ọnuma nke onye-nkpab͕u, mb͕e o doziri àkú ibibi? ma òle ebe ọnuma nke onye-nkpab͕u ahu di? 14 Onye-nkpọrọ nke nēruda eruda emewo ngwa ka atọpu ya; ọ gaghi anwu kwa we rida n'olùlù, nri-ya agaghi-akọ kwa ukọ. 15 Mu onwem bu kwa Jehova Chineke-gi, Onye nēme ka oké osimiri dere du, mb͕e nmali-miri-ya nile nēbib͕ọ: Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya. 16 M'we tiye okwum nile n'ọnu-gi, ọ bu kwa na ǹdò akam ka M'kpuchiworo gi, iku elu-igwe dika ihe-ọkukú, na itọ ntọ-ala nke uwa, na isi Zaion, Ndim ka i bu. 17 Teta, teta, bilie Jerusalem, nke siworo n'aka Jehova ṅua iko nke ọnuma-Ya; ọkwa ahu, bú iko nke isu-ngọngọ, ka i ṅuworo, ṅusia. 18 Ọ dighi onye-ndú o nwere n'etiti umu-ndikom nile ọ muworo: ọ dighi kwa onye nējide aka-ya n'etiti umu-ndikom nile o meworo ka ha tozue okè. 19 Ihe abua ndia adakwasiwo gi; ebere o nwere n'aru gi? nbibi na ntikpọ na oké unwu na mma-agha: M'gēsi aṅa kasie gi obi? 20 Umu-gi ndikom atubọwo atubọ, dina ala n'isi èzí nile, dika anigọ mara n'ọnyà; ha bu ndi juputara n'ọnuma Jehova, na ibasi-nba-ike Chineke-gi. 21 N'ihi nka, biko, nuru nka, gi nwanyi ewedara n'ala, nke ihe nēb͕u kwa, ma ọ bughi manya-vine: 22 otu a ka Onye-nwe-gi siri, bú Jehova, na Chineke-gi Nke nēkpe ọnu ndi-Ya n'ikpe, Le, ewepuwom n'aka-gi iko nke isu-ngọngọ, bú ọkwa ahu nke bu iko nke ọnumam; i gaghi-aṅu kwa ya ọzọ: 23 ma M'gētiye ya n'aka ndi nēmekpa gi aru; ndi siri nkpuru-obi-gi, Ruda n'ala, ka ayi we gabiga: i we me ka azu-gi di ka ala na dika èzí nye ndi nāgabiga.

Aisaia 52

1 Teta, teta, yiri ike-gi dika uwe, gi Zaion; yiri uwe-gi nile mara nma, gi Jerusalem, bú obodo nsọ: n'ihi na onye nēbighi úgwù na onye ruru árú agaghi-abata kwa nime gi ọzọ site n'ub͕u a. 2 Rurupu onwe-gi, si n'ájá puta; bilie, nọdu ala, Jerusalem; tọpu onwe-gi ab͕u di n'olu-gi, gi ada Zaion adọtara n'agha. 3 N'ihi na otú a ka Jehova siri, N'efu ka erere unu; ọ bughi kwa ego ka agēji b͕aputa unu. 4 N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri, Ọ bu Ijipt ka ndim ridaruru na mbu inọ n'ebe ahu dika ọbìa: Asiria kwa, n'efu ka ọ meb͕uru ha. 5 Ma ub͕u a, gini ka M'nwere ebe a, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na ewepuwo ndim n'efu? ndi nāchi ha nākwasi ákwá ike, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ọ bu kwa mb͕e nile n'ogologo ubọchi nile ka anēlelì aham. 6 N'ihi nka ka ndim gāmara aham: n'ihi nka ka ha gāmara n'ubọchi ahu na Mu onwem bu Onye ahu Nke nēkwu okwu; lekwam. 7 Le, ka ha si ma nma nke-uku n'elu ugwu, bú ukwu nke onye nēzisa ozi ọma, bú onye nēme ka anuru okwu udo, onye nēzisa ozi ọma nke ezi ihe, onye nēme ka anuru okwu nzọputa; onye nāsi Zaion, Chineke-gi bu eze! 8 Nuru olu ndi-nche-gi! ha eweliwo olu-ha, n'otù ka ha nētikọ nkpu ọṅù; n'ihi na anya na anya ka ha gāhu mb͕e Jehova nālaghachikute Zaion. 9 Tiwanu nkpu ọṅù, tienu nkpu ọṅù n'ọtù, unu nkpọnkpọ ebe nke Jerusalem: n'ihi na Jehova akasiwo ndi-Ya obi, Ọ b͕aputawo Jerusalem. 10 Jehova ab͕abawo ogwe-aka-Ya di nsọ ọtọ n'anya mba nile; nsọtu nile nke uwa we hu nzọputa nke Chineke-ayi. 11 Wezuganu onwe-unu, wezuganu onwe-unu, sinu n'ebe ahu pua, unu emetula ihe ruru árú: sinu n'etiti ya pua: dinu ọcha, unu ndi nēbu ihe di iche iche nke Jehova. 12 N'ihi na ọ bughi na ngwa ka unu gāpu, ọ bughi kwa na nb͕alaga ka unu gēje: n'ihi na Onye nāga n'iru unu bu Jehova; ọzọ, Onye nāga n'azu unu bu Chineke Israel. 13 Le, orùm gēnwe uche, ọ gādi elu, agēbuli kwa ya, o we di elu nke-uku. 14 Dika ibobo gi si anwu ọtutu madu n'aru, (le ka iru-ya si buru ihe bibiri ebibi nke-uku kari onye ọ bula, udi-aru-ya kwa kari umu madu! ) 15 otú a ka ọ gēfesa ọtutu mba ọbara; n'ihi ya ka ndi-eze gēkpuchi ọnu-ha: n'ihi na ihe nke anākọghi nye ha ka ha huworo; ọ bu kwa ihe nke ha nāhughi ka ha ghọtaworo.

Aisaia 53

1 Ònye kwere ihe ayi nuworo? ogwe-aka Jehova kwa, n'àru onye ka ekpugheworo ya? 2 N'ihi na o tolitere n'iru Ya dika ome, na dika nkpọrọgwu nke putara n'ala kpọrọ nku: ọ dighi udi-aru oma ọ nwere, ọ dighi kwa ima-nma; ayi we hu ya, ma ọ maghi nma n'ile ya anya nke ayi gēji chọsie ya ike. 3 Eledara ya anya, ọ bu kwa onye madu rara aka; onye nwere ọtutu ihe-nb͕u na onye mara ọria nke-ọma: e, dika onye madu nēzonari iru-ha, otú a ka eledara ya anya, ayi we ghara igu ya n'ihe. 4 N'ezie ọria nile nke ayi ka ya onwe-ya bupuworo, ihe-nb͕u nile nke ayi kwa, o buruwo ha; ma ayi onwe-ayi guru ya n'onye etiworo ihe-otiti, onye Chineke tiworo ihe, na onye ewedara n'ala. 5 Ma ya onwe-ya bu onye amapúworo site na njehie nile nke ayi, onye azọpiaworo site n'ajọ omume nile nke ayi: ahuhu-nmehie nke udo-ayi di n'aru ya; ọ bu kwa ubiri-utari-ya ka ejiri me ka aru-ayi di ike. 6 Ayi nile kpafuru akpafu dika ìgwè aturu: ayi chere iru, onye ọ bula n'uzọ nke aka ya: ma Jehova emewo ka ajọ omume nke ayi nile dakwasi ya. 7 Achiri ya n'ihe-ike, ma ya onwe-ya wedara onwe-ya n'ala, we ghara isaghe ọnu-ya; dika aturu nke anākpuru ije n'ob͕ub͕u-ya, na dika nne-aturu nke dara ob͕i n'iru ndi nākpacha ya aji; e, ọ dighi-asaghe ọnu-ya. 8 Site na nmeb͕u, site kwa n'ikpé, ka ewepuru ya: ma ndi ọb͕ọ-ya, ònye n'etiti ha nātughari n'obi na ebipuru ya n'ala ndi di ndu? site na njehie nke ndim ka ihe-otiti diri ya. 9 Ewe me ka ílì-ya di n'etiti ndi nēmebi iwu, ya na ọgaranya nọ kwa n'ọnwu-ya; ọ bu ezie na ọ dighi ihe-ike o mereri, ọ dighi kwa aghughọ di n'ọnu-ya. 10 Ma ọ tọrọ Jehova utọ izọpia ya; O mewo ka ọ ria ọria: ọ buru na nkpuru-obi-ya achu àjà-ikpe-ọmuma, ọ gahu nkpuru-ya, me ka ubọchi-ya nile di ogologo, ihe nke nātọ Jehova utọ gāga kwa nke-ọma n'aka-ya. 11 Ihe nke sitere na ndọb͕u nkpuru-obi-ya nādọb͕u onwe-ya n'ọlu ka ọ gāhu, afọ gēju ya: ihe-ọmuma-ya ka onye ezi omume ahu, bú orùm, gēji me ka ọrà madu ghọ ndi ezi omume: ajọ omume nile ha ka ya onwe-ya gēbu kwa. 12 N'ihi nka ka M'gēkère ya òkè n'etiti ndi bara uba, o gēso kwa ndi nwere ume kèsa ihe ọ kwatara n'agha; n'ihi na ọ b͕apuru nkpuru-obi-ya dika miri nye ọnwu, ọ bu kwa na ndi-njehie ka aguru ya: ma ya onwe-ya bupuru nmehie ọtutu madu, ọ bu kwa ndi-njehie ka ọ nāriọrọ aririọ.

Aisaia 54

1 Tie nkpu ọṅù, gi nwayi-àgà, bú nwayi nāmughi nwa; tiwa nkpu ọṅù, tisi kwa nkpu ike, gi onye ime nwa nēmegh: n'ihi na umu nke nwanyi arapuru nání ya di ọtutu kari umu nke nwanyi aluru na nwunye, ka Jehova siri. 2 Me ka ebe ulo-ikwū-gi sa mbara, ka ha seti kwa ákwà-nkwuba nile nke ebe-obibi-gi nile; eb͕ochila: me ka udọ̀-gi nile di ogologo, me kwa ka ǹtú-gi nile di ike. 3 N'ihi na n'aka-nri na n'aka-ekpe ka i gāb͕asa; nkpuru-gi gēnweta kwa mba di iche iche, ọ bu kwa obodo di iche iche nke tọb͕ọrọ n'efu ka ha gēme ka madu biri nime ha. 4 Atula egwu; n'ihi na ihere agaghi-eme gi: ka aghara itiye kwa gi n'ọnọdu-ihere; n'ihi na agaghi-eme gi ka i nwe iru-ihere: n'ihi na i gēchezọ ihere nke mb͕e i nọ na nwata, ọzọ, ita-uta nke ọnọdu nwayi di-ya nwuru i nọ, i gaghi-echeta ya ọzọ. 5 N'ihi na di-gi bu Onye meworo gi; Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya: ọzọ, onye-nb͕aputa-gi bu Onye Nsọ nke Israel; Chineke nke uwa nile ka anākpọ Ya. 6 N'ihi na Jehova akpọwo gi dika nwanyi arapuru arapu nke o nēwuta kwa ya nime mọ-ya, bú nwunye alutara na nwata, mb͕e ajuru ya, ka Chineke-gi siri. 7 N'otù ntabi-anya di ntà ka M'rapuworo gi arapu; ma obi-ebere nile di uku ka M'gēji chikọta gi. 8 Na nrubiga-ókè nke iwe ka M'zonariri gi irum otù ntabi-anya; ma ebere ebighi-ebi ka M'gēji nwe obi-ebere n'aru gi, ka Jehova, bú Onye-nb͕aputa-gi, siri. 9 N'ihi na otú miri nke Noa ka nka dirim: n'ihi na dika M'ṅuru iyi, si na miri nke Noa agaghi-erubiga kwa uwa ọzọ, otú a ka M'ṅuworo iyi, si na M'gaghi-ewesa gi iwe, na M'gaghi-abasiri gi nba ike. 10 N'ihi na ugwu nile gāpu n'ọnọdu-ha, agēwezuga kwa ugwu ntà nile n'ọnọdu-ha; ma eberem agaghi-esi n'ebe i nọ pua, agaghi-ewezuga kwa ọb͕ub͕a-ndu nke udo nkem n'ọnọdu-ya, ka Onye nwere obi-ebere n'aru gi siri, bú Jehova. 11 Gi nwanyi ewedara n'ala, nke oké ifufe nēfeghari, nke anākasighi obi, le, Mu onwem gēdo nkume-gi nile n'ihe-ichọ-nma, were nkume sapphire tọ ntọ-ala-gi. 12 M'gēme kwa ka elu akuku ulo-gi nile ghọ nkume ruby, me kwa ka ọnu-uzọ-ama-gi nile ghọ nkume carbuncle, me kwa ka ókè-ala-gi nile ghọ nkume di iche iche anāchọsi ike. 13 Ọzọ, umu-gi nile gābu ndi-nmuta Jehova; udo nke umu-gi gāba kwa uba. 14 N'ezi omume ka agēme ka i guzosie ike: gi nọpu nmeb͕u n'ebe di anya, n'ihi na i gaghi-atu egwu; nọpu kwa ihe-ujọ n'ebe di anya, n'ihi na ọ gaghi-abiaru gi nso. 15 Le, ọ buru na onye ọ bula akpalie ise-okwu megide gi, o siteghi na Mu: onye ọ bula nke kpaliworo ise-okwu n'ebe i nọ gāda ada n'ihi gi. 16 Le, Mu onwem ekèwo uzú nke nāfù ọku icheku, nākpu ihe-ọlu iji lu ọlu nke aka ya; Mu onwem ekèwo kwa onye-nbibi imebi emebi. 17 Ọ dighi ihe-agha ọ bula akpuworo imegide gi gāga nke-ọma: ọzọ, ire ọ bula nke gēbili imegide gi n'ikpé ka i gāma ikpe. Nka bu ihe-nketa nke ndi-orù Jehova, ezi omume-ha nēsite nam: ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

Aisaia 55

1 Ge nti, onye ọ bula nke akpiri nākpọ nku, bianu na miri, onye ahu kwa nke nēnweghi ego; bianu, zuru ọka, rie; e, bianu, zuru kwa manya-vine na miri-ara-ehi nējighi ego nārùghi ọnu-ahia. 2 N'ìhi gini ka unu nātù ego inye n'ọnọdu ihe nābughi nri? nà ihe putara na ndọb͕u unu nādọb͕u onwe-unu n'ọnọdu ihe nke nādighi-eju afọ? genum nti nke-ọma, rie ezi ihe, ka ihe nke mara abuba tọ kwa nkpuru-obi-unu utọ. 3 Tọnu nti-unu n'ala, biakutem; nurunu, nkpuru-obi-unu ewe di ndu: Mu na unu gāb͕a kwa ndu, bú ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi, bú ebere nile kwesiri ntukwasi-obi nke emere Devid. 4 Le, enyewom ya ka ọ buru onye-àmà nye ndi nile di iche iche, ka ọ buru onye-ndú na onye-iwu nye ndi nile di iche iche. 5 Le, mba nke i nāmaghi ka i gākpọ, mba nke nāmaghi gi gāb͕akute kwa gi, n'ihi Jehova, bú Chineke-gi, ọbuná n'ihi Onye Nsọ nke Israel; n'ihi na O mewo ka i ma nma. 6 Chọnu Jehova mb͕e anāchọta Ya, kpọkuenu Ya mb͕e Ọ nọ nso: 7 onye nēmebi iwu, ya rapu uzọ-ya, onye nēme ajọ ihe, ya rapu èchìchè-ya nile: ya laghachikute kwa Jehova, Ọ gēnwe kwa obi-ebere n'aru ya; ya laghachikute kwa Chineke-ayi, n'ihi na Ọ gāb͕aghara ya nmehie-ya n'uba. 8 N'ihi na èchìchè nkem, ha abughi èchìchè-unu, uzọ-unu kwa, ha abughi uzọm; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 9 N'ihi na dika elu-igwe si di elu kari uwa, otú a ka uzọm nile di elu kari uzọ nile unu, ọ bu kwa otú a ka èchìchèm nile di elu kari èchìchè nile unu. 10 N'ihi na dika oké miri-ozuzọ na snow si esi n'elu-igwe ezo, ma ọ bughi n'ebe ahu ka ọ nālaghachi, ma ọ buru na o bughi uzọ desia ala, we me ka o me ihe-omume, ka o pu kwa ihe-opupú; o we were nkpuru nye ọgha-nkpuru, were kwa nri nye onye nēri ihe; 11 otú a ka okwum di nke nēsi n'ọnum puta: ọ gaghi-alaghachikutem n'efu, ma ọ buru na o bughi uzọ mezu ihe tọrọm utọ, we ga nke-ọma n'ihe M'zigara ya. 12 N'ihi na ọṅù ka unu gēji puta, udo ka agēji kwa duru unu: ugwu nile na ugwu ntà nile gētiwa nkpu ọṅù, n'iru unu, osisi nile nke ọhia gāku kwa aka-ha. 13 Nọnọdu ogwu osisi fir gētolite, ọ bu kwa n'ọnọdu nke ka osisi myrtle gētolite: o we ghọrọ Jehova aha, ghọ-kwa-ra Ya ihe-iriba-ama ebighi-ebi nke anāgaghi-ebipu ya.

Aisaia 56

1 Otú a ka Jehova siri, Debenu ikpé ziri ezi, me-kwa-nu ezi omume: n'ihi na nzọputam di nso ibia, ezi omumem di kwa nso ka ekpughe ya. 2 Onye ihe nāgara nke-ọma ka onye nēme nka na nwa madu nke nējidesi ya ike bu; onye nēdebe ubọchi-izu-ike ghara ime ya ka ọ ghara idi nsọ, nke nēdebe kwa aka-ya ghara ime ihe ọjọ ọ bula. 3 Ka nwa ala ọzọ nke raparaworo na Jehova ghara ikwu okwu, si, Jehova aghaghi ikewapum na ndi-Ya: ka onozi ghara kwa isi, Le, mu onwem bu osisi kpọnwuru akponwu. 4 N'ihi na otú a ka Jehova siri ndi-onozi ndi nēdebe ubọchi-izu-ikem nile, ndi rọputawo-kwa-ra ihe tọrọm utọ, ndi nējidesi kwa ọb͕ub͕a-ndum ike: 5 M'gēnye, ha n'ulom na nime mb͕idim nile ihe-ncheta na aha di nma kari umu-ndikom, kari kwa umu-ndinyom; aha ebighi-ebi ka M'gēnye ha n'otù n'otù, nke anāgaghi-ebipu. 6 Umu ala ọzọ kwa, ndi nārapara Jehova, ijere Ya ozi, na ihu aha Jehova n'anya, na iburu Ya ndi-orù, onye ọ bula nke nēdebe ubọchi-izu-ike ghara ime ya ka ọ ghara idi nsọ, nke nējidesi kwa ọb͕ub͕a-ndum ike; 7 M'gēme ka ha biarue ugwu nsọm, M'gēme kwa ka ha ṅuria n'ulo-ekperem; àjà-nsure-ọku nile ha na àjà nile ha gābu ihe nātọ utọ n'elu ebe-ichu-àjàm: n'ihi na agākpọ ulom ulo ekpere diri ndi nile di iche iche. 8 Ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi puta, bú Jehova Nke nāchikọta ndi Israel achupuru achupu, Ọ si, Ndi ọzọ di kwa M'gāchikọtara ya, chikọtara ndi-ya achikọtara achikọta. 9 Unu anu ọhia nile, bianu iri ihe, unu anu nile di n'oké ọhia. 10 Ndi-nche-ya bu ndi-ìsì, ha nile amaghi ama; ha nile bu nkita dara ob͕i, ha apughi ib͕ọ uja; ha bu ndi nārọ nrọ, nēdina ala, nāhu itu-òrù-ura n'anya. 11 Nkita-ya nile nēribiga ihe ókè, ha amaghi afọ-ojuju; ndi ahu bu kwa ndi-ọzùzù-aturu nāmaghi ighọta ihe: ha nile echewo uzọ nke aka ha iru, onye ọ bula ọ che urù-ya iru site n'akuku nile ọ bula. 12 Ha si, Bianu, ka m'weta manya-vine, ka ayi ṅubiga kwa ihe-ọṅuṅu nābà n'anya ókè; echi gādi kwa ka ta, ubọchi di uku gabiga ókè nke-uku.

Aisaia 57

1 Onye ezi omume nāla n'iyì, ma ọ dighi onye ọ bula nētiye ya n'obi-ya; anēkpochapu kwa ndi-ebere, mb͕e ọ nādighi onye nāghọta na ekpochapuworo onye ezi omume n'iru ihe ọjọ. 2 Ọ nābà n'udo; ha nēzu ike n'elu ihe-ndina-ya, onye ọ bula nke nāgazi agazi. 3 Ma unu onwe-unu, biaruenu nso ebe a, unu umu-ndikom nke nwanyi ji igwe-oji atu isi ọma na isi ọjọ, unu nkpuru nke nwoke nākwa iko na nwanyi nākwa iko. 4 Ònye ka ọ nātọ unu utọ imegide? ònye ka unu nāsaghepu ọnu mbara, riputasi kwa ire, imegide? ùnu onwe-unu abughi umu njehie, nkpuru okwu-ugha, 5 unu ndi nēme onwe-unu ka unu di ọku n'etiti osisi terebinth, n'okpuru osisi ndu ọ bula; ndi nēb͕u umu-unu na ndagwurugwu nile n'okpuru nb͕awa nke nkume nile di elu? 6 N'etiti nkume kwọrọ murumuru nke miri-iyi ka òkè-gi di; ha onwe-ha, ha onwe-ha bu ihe ruru gi n'ife-nzà: ọ bu kwa ha ka i wusiworo àjà-ihe-ọṅuṅu nye, sure kwa àjà-nsure-ọku, bú onyinye-inata-iru-ọma. Àgākasim obi bayere ihe ndia? 7 N'elu ugwu di elu, nke eme-kwa-ra ka ọ di elu, ka i doworo ihe-ndina-gi: ọ bu kwa n'ebe ahu ka i rigoro ichu àjà. 8 Ọ bu kwa n'azu ọnu-uzọ-gi na akuku-ọnu-uzọ-gi ka i doworo ihe-ncheta-gi: n'ihi na mb͕e M'nānọghi ka i kpupuru ihe-ndina-gi, we rigo: i mere ka ihe-ndina-gi sa mbara, we soro ha b͕ara onwe-gi ndu; i huru ihe-ndina-ha n'anya; aka-ha ka i huru. 9 I we were manu jegharikuru eze ahu, i me-kwa-ra manu-otite-gi nēsì ísì utọ ka ha ba uba, i zi-kwa-ra ndi-ukọ-gi n'ebe di anya, i we me onwe-gi ka i di ala rue ala-mọ. 10 N'iba-uba nke uzọ-gi ka ike gwusiri gi; i sighi, Ntukwasi-obi adigh: ndu aka-gi ka i chọtara; n'ihi ya i riaghi ọria. 11 Ma ònye ka i cheb͕uworo onwe-gi bayere ya, we tua egwu ya, na i nēkwu okwu-ugha, we ghara ichetam, ghara kwa itiye ya n'obi-gi? Mù onwem adighi-ab͕a nkiti ọbuná site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, i we ghara itu egwum? 12 Mu onwem gēgosi ezi omume-gi; ma ọlu-gi nile, ha agaghi-abara gi urù. 13 Mb͕e i nēti nkpu, ka ndi i chikọtaworo naputa gi; ma ha nile ka ifufe gēfepu, otù nku-ume gēkupu ha: ma onye ahu nke nab͕abà nimem gēketa ala, nweta kwa ugwu nsọm. 14 Ọ gāsi kwa, Tulienu, tulienu, dozienu uzọ, bupunu ihe-isu-ngọngọ n'uzọ ndim. 15 N'ihi na otú a ka Ọ siri, bú Onye di elu, Nke eme-kwa-ra ka Ọ di elu, Onye nēbi ebi mb͕e nile ebighi-ebi, Onye Nsọ ka aha-Ya bu kwa: Ọ si, N'ebe di elu di kwa nsọ ka M'bi, M'biye-kwa-ra onye mọ-ya bu ihe azọpiara azọpia di kwa ala, ime ka mọ nke ndi di ume-ala n'obi di ndu, na ime ka obi nke ndi azọpiara azọpia nime mọ-ha di ndu. 16 N'ihi na ọ bughi rue mb͕e ebighi-ebi ka M'gānalu ọ̀gù, ọ bughi kwa rue mb͕e nile ka M'ganēwe iwe: n'ihi na mọ gāda #mbà n'irum, ya na nkpuru-obi nile Mu onwem meworo. 17 N'ihi ajọ omume nke urù-ya ka M'were iwe, we tie ya ihe, nēzobe irum nēwe kwa iwe: o we nāga nēchighari azu n'uzọ nke obi-ya. 18 Uzọ-ya nile ka M'huworo, M'gēme kwa ka aru di ya ike: M'gēdu kwa ya, nyeghachi ya nkasi-obi nile, nyeghachi kwa ndi-ya nēru újú. 19 Anamekè nkpuru eb͕ub͕ere-ọnu abua: Udo, udo, diri onye nọ n'ebe di anya, di-kwa-ra onye nọ nso, ka Jehova siri; M'gēme kwa ka aru di ya ike. 20 Ma ndi nēmebi iwu di ka oké osimiri nke nāmaghari amaghari: n'ihi na ọ pughi idi jū, miri-ya nāmaputa kwa urọ na apiti. 21 Ọ dighi udo ndi nēmebi iwu nwere, ka Chinekem siri.

Aisaia 58

1 Were akpiri kpọ nkpu, eb͕ochila, welie olu-gi dika opì-ike, we gosi ndim njehie-ha, gosi kwa ulo Jekob nmehie-ha. 2 Ma Mu ka ha nāchọ kwa-ubọchi, imara uzọm nile nātọ kwa ha utọ: dika mba nke mere ezi omume, nke nārapughi kwa ikpé nke Chineke-ha, ha nāriọm ikpé nile nke ezi omume, ibiaru Chineke nso nātọ ha utọ. 3 Ha si, N'ìhi gini ka ayi būworo ọnu, ma I hughi? n'ìhi gini ka ayi wedaworo nkpuru-obi-ayi n'ala, ma I dighi-ama? Le, n'ubọchi obubu-ọnu-unu unu nāchọputa ihe nātọ unu utọ, ọ bu kwa ihe nile nke putara na ndọb͕u ndi-ọlu-unu nādọb͕u onwe-ha n'ọlu ka unu nānara n'ihe-ike. 4 Le, ọ bu n'ihi ise-okwu na ilu-ọ̀gù ka unu nēbu ọnu, ya na iwere ọkpọ nke nmebi-iwu tib͕ue: unu adighi-ebu ọnu dika ta ime ka anuru olu-unu n'elu. 5 Ọ̀ bu dika nka ka obubu-ọnu nke M'nārọputa bu? bú ubọchi madu gēweda nkpuru-obi-ya n'ala? Ọ̀ bu iruda isi-ya n'ala dika amì, na ib͕asa-ákwà-nkpe na ntu n'okpuru ya? ọ̀ bu nka ka i gākpọ obubu-ọnu na ubọchi nātọ Jehova utọ? 6 Ọ̀ bughi nka bu obubu-ọnu M'nārọputa? itọpu ab͕u nile nke nmebi-iwu, itọsa ihe-ọkiké nile nke yoke, na izilaga ndi anēmeb͕u emeb͕u ka ha nwere onwe-ha, ka unu tiji kwa yoke ọ bula? 7 Ọ̀ bughi ikèsara onye agu nāgu nri-gi, ka i me kwa ndi ewedara n'ala ndi nāwaghari awaghari ka ha bata n'ulo-gi? mb͕e i huru onye b͕a ọtọ, ka i kpuchie ya: ka i ghara kwa izonari onye-aru-gi onwe-gi? 8 Mb͕e ahu ka ìhè-gi gāwaputa dika ututu, anu-aru ọhu gēpuchi kwa n'aru-gi ngwa ngwa: ezi omume-gi gāga kwa n'iru gi: nsọpuru Jehova gāga n'azu gi. 9 Mb͕e ahu ka i gākpọ òkù, Jehova gāza kwa; i gētiku Ya, Ọ gāsi kwa, Lekwam. Ọ buru na i si n'etiti gi wezuga yoke ahu, na nsetipu nkpisi-aka, na ikwu ajọ ihe; 10 ọ buru kwa na i weputara onye agu nāgu ihe nkpuru-obi-gi chọrọ, ọ buru na i me ka afọ ju nkpuru-obi ewedara n'ala; ìhè-gi gāwa nime ọchichiri, oké ọchichiri-gi gādi kwa ka etiti-ehihie: 11 Jehova ganēdu kwa gi mb͕e nile, me ka afọ ju nkpuru-obi-gi n'ebe nile nkpọrọ nku, Ọ gēme kwa ka ọkpukpu-gi nile di ike; i gādi kwa ha ubi ab͕ara ogige nke dere miri nke-ọma, di kwa ka ebe miri nāsuputa nke miri-ya nādighi-ata ata. 12 Ndi gēsi n'aru-gi puta gēwu kwa ebe nile bu nkpọnkpọ ebe site na mb͕e ebighi-ebi gara aga: ntọ-ala nke ọtutu ọb͕ọ ka i gēwuli; agākpọ kwa gi Onye-nmechi ntipú, Onye-nkwazi okporo-uzọ ibi ebi. 13 Ọ buru na i me ka ukwu-gi si n'ubọchi-izu-ike chighari, i we ghara ime ihe nātọ gi utọ n'ubọchi nsọm; ọ buru kwa na i kpọ ubọchi-izu-ike ihe-utọ, i kpọ kwa ihe nsọ nke Jehova ihe-nsọpuru; i we sọpuru ya, ghara ime ihe bu uzọ-gi nile, ghara ichọputa ihe nātọ gi utọ ma-ọbu ikwu okwu nke aka gi: 14 mb͕e ahu ihe Jehova gātọ gi utọ; M'gēme kwa ka i nọkwasi ebe nile di elu nke uwa dika inyinya; M'gēme kwa ka i rie ihe-nketa nke Jekob, bú nna-gi: n'ihi na ọnu Jehova ekwuwo.

Aisaia 59

1 Le, aka Jehova adighi nkpunkpu kari izọputa; nti-Ya adighi kwa arọ́ kari inu ihe: 2 kama ajọ omume nile unu aghọwo ihe nākpa ókè n'etiti unu na Chineke-unu, nmehie nile unu ezonariwo kwa unu iru-Ya, O we ghara inu. 3 N'ihi na ejiwo ọbara meru aka-unu, ejiwo kwa ajọ omume meru nkpisi-aka-unu; eb͕ub͕ere-ọnu-unu ekwuwo okwu-ugha, ire-unu nātamu ajọ ihe. 4 Ọ dighi onye nākpọ madu eje ikpé n'ezi omume, ọ dighi kwa onye nēji ikwesi-ntukwasi-obi eje ikpé: ha nātukwasi obi n'ihe tọb͕ọrọ n'efu, ha nēkwu kwa okwu-ugha; ha nāturu ime ọnọdu ọjọ, mua ajọ ihe. 5 Àkwá ubí ka ha buworo, ọ bu kwa ulo ududo ka ha nātu: onye ahu nke nēri àkwá-ha gānwu, ọzọ, nke anāzọpia gāb͕awaputa aju-ala. 6 Ulo-ududo-ha agaghi-aghọ uwe, ha agaghi-eji kwa ọlu di iche iche ha kpuchie onwe-ha: ọlu nile ha bu ọlu ajọ ihe, omume nke ihe-ike di kwa n'aka-ha. 7 Ukwu-ha nāb͕a ọsọ ime ihe ọjọ, ha nēme kwa ngwa iwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ: èchìchè nile ha bu èchìchè ajọ ihe; nbibi na ntipia di n'okporo-uzọ nile nke ha. 8 Uzọ udo ka ha nāmaghi; ọ dighi kwa ikpé ziri ezi di n'uzọ nile ha: ha emewo ka okporo-uzọ nile ha b͕agọrọ ha ab͕agọ; onye ọ bula nke nāzọ ije na ya adighi-ama udo. 9 N'ihi ya ikpé nke ziri ezi adiwo anya n'ebe ayi nọ, ezi omume adighi-eru kwa ayi aru: ayi nēle anya ìhè, ma le, ọ bu ọchichiri; ayi nēle anya onwunwu-ọku, ma ọ bu n'oké ọchichiri ka ayi nējeghari. 10 Ayi nāsọghari ìsì na mb͕idi dika ndi-ìsì, e, ayi nāsọghari ìsì dika ndi nēnweghi anya: ayi asuwo ngọngọ n'etiti-ehihie dika ọ bu chi-ojiji; n'etiti ndi nwere ezi ndu ayi nọ ka ndi nwuru anwu. 11 Ayi nāb͕ọ uja dika bear, ayi nile, ọ bu kwa dika nduru ka ayi nēkwosi ákwá ike: ayi nēle anya ikpé ziri ezi, ma ọ digh: ayi nēle anya nzọputa, ma ọ di anya n'ebe ayi nọ. 12 N'ihi na njehie-ayi bara uba n'iru Gi, nmehie nile nke ayi azawo kwa megide ayi: n'ihi na ayi na njehie nile ayi nọkọ n'otù; ọzọ, ajọ omume nile ayi, ayi mara ha: 13 njehie, na igọnari Jehova, na isi n'iso Chineke-ayi laghachi azu, na ikwu okwu nmeb͕u na nwezuga, na ime okwu-ugha nile site n'obi-ayi, na ikwuputa ha. 14 Emewo kwa ka ikpe ziri ezi laghachi azu, ezi omume nēguzo kwa n'ebe di anya: n'ihi na ezi-okwu asuwo ngọngọ n'amá, izi-ezi apughi kwa ibata. 15 E, ezi-okwu aghọwo ihe anāhughi; ọzọ, onye nēsi n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya nēme onwe-ya ihe-nkwata: Jehova we hu ya, ọ jọ njọ n'anya-Ya na ikpé ziri ezi adighi. 16 O we hu na ọ dighi onye ọ bula di; ibobo we nwua Ya n'aru na ọ dighi onye nāriọrọ ayi aririọ: ogwe-aka-Ya we wetara Ya nzọputa; ezi omume-Ya kwa, nke ahu nākwagide Ya. 17 O we yiri ezi omume dika uwe-agha, kpu kwa okpu-agha nzọputa n'isi-Ya; O yiri kwa uwe nile nke ibọ̀-ọ́bọ̀ ka ha buru uwe-oyiyi-Ya, O were ekworo kpuchie Onwe-ya dika uwe-nwuda. 18 Dika nmeso nile ha si di, otú a ka Ọ gākwughachi, ọnuma ka Ọ gākwughachi ndi nēmegide Ya, nmeso-ha ka Ọ gākwughachi ndi-iro-Ya; Ọ gākwughachi agwe-etiti nile nmeso-ha. 19 Ha gātu kwa egwu aha Jehova site n'Ọdida-anyanwu, tu kwa egwu ebube-Ya site n'ọwuwa anyanwu: mb͕e onye-nkpab͕u gābata dika miri-iyi, Mọ nke Jehova ganēbuli ọkọlọtọ imegide ya. 20 Otù onye-nb͕aputa gābiaru kwa Zaion, biakute ndi nēsi na njehie chigharia nime Jekob; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 21 Ma Mu onwem, nka bu ọb͕ub͕a-ndum nke di n'etiti Mu na ha, ka Jehova siri: Mọm nke di n'aru gi, na okwum nile nke M'tiyeworo n'ọnu-gi, agaghi-apu n'ọnu-gi, na n'ọnu nkpuru-gi, na n'ọnu nkpuru nke nkpuru-gi, ka Jehova siri, site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi.

Aisaia 60

1 Bilie, nwue; n'ihi na ìhè-gi abiawo, ebube Jehova awawo kwa n'aru gi dika anyanwu. 2 N'ihi na, le, ọchichiri nēkpuchi kwa ndi nile di iche iche: ma n'aru gi ka Jehova gāwa dika anyanwu, ebube-Ya ka agāhu kwa n'aru gi. 3 Mba nile gējeru kwa ìhè-gi, ndi-eze ejerue onwu-maramara nke ọwuwa-gi. 4 Welie anya-gi abua le buruburu, hu: ha nile achikọtawo onwe-ha, ha abiakutewo gi: umu-gi ndikom gēsi n'ebe di anya bia, agēku kwa umu-gi ndinyom n'akuku-gi. 5 Mb͕e ahu i gāhu we nwue enwu, obi-gi gātu kwa oké egwu, sa mbara; n'ihi na agēchigharikute gi ihe bara uba nke oké osimiri, àkù nke mba di iche iche gābiakute gi. 6 Ìgwè camel gēkpuchi gi, umu-camel nke Midian na Ifa: ha nile gēsi na Sheba bia: ọla-edo na frankincense ka ha gēbute, ọ bu kwa ozi ọma otuto Jehova ka ha gēzisa. 7 Ìgwè ewu na aturu nile nke Kida ka agāchikọtara gi, ebulu nile nke Nebaiot gējere gi ozi: ha gārigota n'ebe-ichu-àjàm dika ihe nātọ utọ, M'gēme kwa ulo nke ima-nmam ka ọ ma nma. 8 Òle ndi bu ndia nke nēfe efe dika igwe-oji, ndi nēfe kwa dika nduru si eferue window-ha? 9 N'ezie Mu ka agwe-etiti nile gēchere, ub͕ọ nile nke Tashish gēbu kwa uzọ, ime ka umu-gi ndikom si n'ebe di anya bia, ha na ọla-ọcha-ha na ọla-edo-ha, ibiakute aha Jehova, bú Chineke-gi, na ibiakute Onye Nsọ nke Israel, n'ihi na O mewo ka i ma nma. 10 Umu ala ọzọ gēwu kwa mb͕idi-gi nile, ndi-eze-ha gēje-kwa-ra gi ozi: n'ihi na n'iwem ka M'tiworo gi ihe, ma na mb͕e ihe-gi nātọm utọ ka M'nweworo obi-ebere n'aru gi. 11 Ọnu-uzọ-ama-gi nile gēghe kwa oghe mb͕e nile; agaghi-emechi ha n'ehihie ma-ọbu n'abali; ka madu we bubatara gi àkù nke mba di iche iche, ndi-eze-ha aburu kwa ndi anēdu edu. 12 N'ihi na mba ahu na ala-eze ahu nke nāgaghi-efè gi gāla n'iyì; e, aghaghi ime ka mba ahu nile tọb͕ọrọ n'efu. 13 Ebube Lebanon gābiakute gi, osisi fir na osisi pine na osisi cypress n'otù; ime ka ọnọdu ebe nsọm ma nma, M'gēme kwa ka ọnọdu ukwum abua nwe nsọpuru. 14 Ọzọ, umu nke ndi nēweda gi n'ala gējekuru gi nēruda n'ala; ndi nile nke nēlelì gi anya gākpọ kwa isi ala n'ọbu-ukwu nke ukwu-gi abua; ha gākpọ kwa gi, Obodo Jehova, Zaion nke Onye Nsọ nke Israel. 15 N'onọdu ibu onye arapuru arapu na onye anākpọ asì nke i buworo, nke ọ nādighi onye nāgabiga n'etiti gi, M'gēme gi ka i ghọ nbili-elu ebighi-ebi, na ihe obi-utọ nke ọtutu ọb͕ọ. 16 I gāṅu kwa miri-ara nke mba di iche iche, ọ bu kwa ara ndi-eze ka i gāmi: i we mara na Mu onwem, Jehova, bu Onye-nzọputa-gi na Onye-nb͕aputa-gi, bú Onye di ike nke Jekob. 17 N'ọnọdu ọla M'gēweta ọla-edo, n'ọnọdu ígwè M'gēweta ọla-ọcha, n'ọnọdu osisi M'gēweta ọla, n'ọnọdu nkume M'gēweta ígwè: M'gēme kwa ka ndi-nlekọta-gi ghọ udo, M'gēme kwa ka ndi nāchi gi n'ihe-ike ghọ ezi omume. 18 Agaghi-anu kwa ihe-ike ọzọ n'ala-gi, agaghi-anu nbibi na ntipia n'ókè-ala-gi nile; ma i gākpọ mb͕idi-gi nile Nzọputa, kpọ kwa ọnu-uzọ-ama-gi nile Otuto. 19 Anyanwu agaghi-abū-kwa-ra gi ìhè ọzọ n'ehihie; ma n'onwu-maramara ọnwa agaghi-enye gi ìhè: ma Jehova gāghọrọ gi ìhè ebighi-ebi, Chineke-gi gāghọ-kwa-ra gi ima-nma-gi. 20 Anyanwu-gi agaghi-ada kwa ọzọ, ọnwa-gi agaghi-ewepu kwa onwe-ya: n'ihi na Jehova gāghọrọ gi ìhè ebighi-ebi, ubọchi nile nke iru-újú-gi ewe zue ezu. 21 Ndi-gi kwa, ha nile gābu ndi ezi omume, rue mb͕e ebighi-ebi ka ha gēnweta ala; alaka nke ọkukúm, ọlu akam, ime ka M'ma nma. 22 Onye ntà n'etiti ha gāghọ nnù abua na ọgu iri, onye dikarisiri ntà gāghọ kwa mba nwere ume: Mu onwem, Jehova, gēme ka ọ bia ọsọsọ na mb͕e-ya.

Aisaia 61

1 Mọ nke Onye-nwe-ayi, bú Jehova, di n'arum; n'ihi na Jehova etewom manu izì ndi ewedara n'ala ozi ọma; O zitewom ikechi ọnyá ndi obi-ha tiwara etiwa, ikpọsa ọrira gwa ndi adọtara n'agha, na ikpọsa nmeghepu ulo-nkpọrọ gwa ndi ekere ab͕u; 2 ikpọsa arọ mb͕e ihe madu nātọ Jehova utọ, na ubọchi ibọ̀-ọ́bọ̀ Chineke-ayi nwere; ikasi ndi nile nēru újú obi; 3 idoro ndi Zaion nēru újú, inye ha ihe ọma ike n'isi n'ọnọdu ntu, manu obi-utọ n'ọnọdu iru-újú, ákwà-nb͕okwasi otuto n'ọnọdu mọ nke inyoghi-inyoghi; ka enwe kpọ ha osisi oak nke ezi omume, ihe-ọkukú nke Jehova, ime ka ọ ma nma. 4 Ha gēwu kwa ebe nile nke bu nkpọnkpọ ebe site na mb͕e ebighi-ebi gara aga; ebe nile nke tọb͕ọrọ n'efu nke ndi mbu ka ha gēwuli, me kwa ka nkpọnkpọ obodo nile di ọhu, bú ebe tọb͕ọrọ n'efu nke ọtutu ọb͕ọ gara aga. 5 Ndi ala ọzọ gēguzo nāzù ìgwè ewu na aturu-unu, umu ala ọzọ gābu kwa ndi-ọlu-ubi-unu na ndi-ọlu-ubi-vine-unu. 6 Ma agākpọ unu onwe-unu ndi-nchu-àjà nke Jehova: ndi nējere Chineke-ayi ozi ka agāsi na unu bu: àkù nke mba di iche iche ka unu gēri, ọ bu kwa na nsọpuru-ha ka unu gānya isi. 7 N'ọnọdu ihere-unu unu gēnwe okpukpu: n'ọnọdu-ihere ha gēti nkpu ọṅù n'òkè-ha: n'ihi ya n'ala-ha okpukpu ka ha gēnweta: ọṅù ebighi-ebi gādiri ha. 8 N'ihi na Mu onwem, Jehova, nāhu ikpé ziri ezi n'anya, anamakpọ nnapu-n'ihe-ike n'ajọ omume asì; M'gēnye kwa ha ugwọ-ọlu-ha n'ezi-okwu, ọ bu kwa ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ka Mu na ha gāb͕a. 9 Agāma kwa nkpuru-ha n'etiti mba nile, na umu nke putara n'aru ha n'etiti ndi nile di iche iche: ndi nile ndi nāhu ha anya gāmata ha, na ha onwe-ha bu nkpuru nke Jehova gọziworo. 10 Obi gātọm utọ nke-uku nime Jehova, nkpuru-obim gēteghari egwú ọṅù nime Chinekem; n'ihi na Ọ chiriwo uwe nzọputa yikwasim, O werewo uwe-nwuda ezi omume kpuchiem, dika onye nālu nwunye ọhu si ewere ihe ọma ike n'isi ke onwe-ya dika onye-nchu-àjà, na dika nwanyi anālu ọhu si ewere ihe-ejiji-ya nile chọ onwe-ya nma. 11 N'ihi na dika ala si eme ka ihe-opupú-ya puta, na dika ubi ab͕ara ogige si eme ka ihe aghaworo nime ya pue; otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova gēme ka ezi omume na otuto pute n'iru mba nile.

Aisaia 62

1 N'ihi Zaion m'gaghi-edebe ọnum du, na n'ihi Jerusalem m'gaghi-anọ jū, rue mb͕e ezi omume-ya gāputa ihè dika onwu-maramara, nzọputa-ya kwa dika ọwa nke nēnwu enwu. 2 Mba di iche iche gāhu kwa ezi omume-gi, eze nile gāhu nsọpuru-gi: agākpọ kwa gi aha ọhu nke ọnu Jehova gāgu. 3 I gāghọ kwa okpu-eze nke ima-nma n'aka Jehova, na ákwà-ike-n'isi nke ala-eze n'ọbu-aka Chineke-gi. 4 Agaghi-agu kwa gi aha Nwanyi arapuru arapu ọzọ; agaghi-agukwa ala-gi aha Ala tọb͕ọrọ n'efu ọzọ: n'ihi na gi ka agākpọ Hefzi-ba, agākpọ kwa ala-gi Beula: n'ihi na ihe-gi nātọ Jehova utọ, agālu kwa ala-gi dika nwunye. 5 N'ihi na dika nwa-okorọbia si aluru nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, otú a ka umu-gi ndikom gālu gi: ọzọ, dika obi-utọ nke onye nālu nwunye ọhu nwere n'aru nwunye ọhu ya, otú a ka obi gātọ Chineke utọ n'aru gi. 6 N'elu mb͕idi-gi nile, Jerusalem, ka M'doworo ndi-nche; ogologo ubọchi nile ehihie na abali, mb͕e nile, ha agaghi-edebe ọnu-ha du: unu ndi nēchetara Jehova ihe, unu ederela du, 7 unu ekwe-kwa-la ka O dere du, rue mb͕e Ọ gēme ka Jerusalem guzosie ike, ru kwa mb͕e Ọ gēme ya ka ọ buru otuto n'uwa. 8 Jehova ewerewo aka-nri-Ya, were kwa ogwe-aka-Ya di ike, ṅua iyi, si, N'ezie M'gaghi-enye kwa ọka-gi ọzọ iburu ndi-iro-gi ihe-oriri ma-ọli; n'ezie umu ala ọzọ agaghi-aṅu kwa manya-vine ọhu gi, nke i dọb͕uworo onwe-gi n'ọlu bayere ya: 9 kama ndi chikọtaworo ya gēri ya, we to Jehova; ndi kpokọtaworo ya gāṅu kwa ya n'ogige nsọm nile. 10 Gabiganu, gabiganu n'ọnu-uzọ-ama nile; dozienu uzọ ndim; tulienu, tulienu uzọ atuliri atuli; tutupunu nkume; bulienu ọkọlọtọ n'elu ndi nile di iche iche. 11 Le, Jehova emewo ka anuru ya rue nsọtu uwa, si, Sinu ada Zaion, Le, nzọputa-gi abiawo; le, ọkwukwu-ugwọ-Ya di n'aka-Ya, ugwọ-ọlu-Ya di kwa n'iru Ya. 12 Ha gākpọkwa ha Ndi nsọ ahu, Ndi Jehova b͕aputaworo: agākpọ kwa gi Obodo achọputara achọputa, Obodo anārapughi arapu.

Aisaia 63

1 Ònye bu nka nēsi n'Edom bia, yiri uwe nācha ọbara-ọbara site na Bọzra? Ònye a nke mara nma n'uwe-oyiyi-Ya, nāzọ ije n'iba-uba nke ike-Ya? Ọ bu Mu onwem nke nēkwu okwu n'ezi omume, di ike izọputa. 2 Gini mere ọ nācha uhie uhie n'uwe-oyiyi-Gi? gini mere uwe-Gi ji di ka onye nāzọ ukwu n'ebe-inara-manya-vine? 3 Ebe-nzọcha-nkpuru-vine ka M'zọchara, náním; ma nime ndi nile di iche iche ọ dighi onye ọ bula Mu na ya nọ: M'we zọcha ha n'iwem, zọda ha n'ọnumam; ọbara-ndu-ha we fesa n'uwem nile, ọ bu kwa uwe-oyiyim nile ka M'meruru emeru. 4 N'ihi na ubọchi ibọ̀-ọ́bọ̀ di n'obim, arọ nke ndi M'b͕aputaworo abiawo kwa. 5 M'we legide anya, ma ọ dighi onye nēne aka; ibobo we nwuam n'aru na ọ̀ dighi onye nākwagide: ogwe-akam we wetaram nzọputa; ọnumam kwa, ya kwagiderem. 6 M'we zọda ndi di iche iche n'iwem, me ka ha ṅubiga ihe-ọṅuṅu nābà n'anya n'ọnumam, M'we me ka ọbara-ndu-ha ruda n'ala. 7 Ebere nile nke Jehova ka M'gēhota, ha na otuto nile nke Jehova, dika ihe nile si di nke Jehova mesoworo ayi; na iba-uba nke ezi ihe emere ulo Israel, nke O mesoworo ha dika obi-ebere-Ya nile si di, na dika iba-uba nke ebere-Ya si di. 8 O we si, N'ezie, ndim ka ha bu, umu ndi nādighi-ekwu okwu-ugha: O we ghọrọ ha onye-nzọputa. 9 Na nkpab͕u nile ha Ya ka anākpab͕u, ọ bu kwa mọ-ozi nke iru-Ya zọputara ha: n'ihu-n'anya-Ya na n'ọmiko-Ya Ya onwe-ya b͕aputara ha; O we palie ha, kuru ha ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga. 10 Ma ndi ahu nupuru isi, me ka o wuta Mọ Nsọ Ya: O we chigharia ghọrọ ha onye-iro, Ya onwe-ya busoro ha agha. 11 Ndi-Ya we cheta ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga nke Moses, si, Òle ebe Onye ahu nọ nke mere ka ha si n'oké osimiri rigoputa n'aka onye nāzù ìgwè ewu na aturu-Ya? òle ebe Onye ahu nọ nke tiyere Mọ Nsọ Ya n'etiti ha? 12 Nke nēme ka ogwe-aka-Ya mara nma je ije n'aka-nri Moses? Nke nēkewa miri n'iru ha, imere Onwe-ya aha ebighi-ebi? 13 Nke nēme ka ha je ije n'ob͕u-miri dika inyinya n'ọzara, ha we ghara isu ngọngọ? 14 Dika anu-ulo nke nārida na ndagwurugwu, otú a ka Mọ nke Jehova nēme ka ha zuru ike: otú a ka I duru ndi-Gi, imere Onwe-gi aha mara nma. 15 Si n'elu-igwe legide anya, si kwa n'ebe-obibi nke idi-nsọ-Gi na nke ima-nma-Gi le: òle ebe ekworo-Gi na idi-ike-Gi nile di? idà-udà nke ngiri-afọ-Gi na obi-ebere-Gi nile n'ebe m'nọ jisiri onwe-ha ike. 16 N'ihi na Gi onwe-gi bu Nna-ayi; n'ihi na Abraham amaghi ayi, Israel adighi-amata kwa ayi: Gi onwe-gi, Jehova, bu Nna-ayi; Onye-nb͕aputa-ayi site na mb͕e ebighi-ebi gara aga ka aha-Gi bu. 17 Jehova, n'ìhi gini ka I nēme ka ayi si n'uzọ-Gi nile kpafue? n'ìhi gini ka I nēme ka obi-ayi si n'egwu-Gi sie ike? Lata n'ihi ndi-orù-Gi, bú ebo nile nke ihe-nketa-Gi. 18 Ọ bu nání mb͕e ntà ka ndi nsọ Gi nwetara ya: ndi nākpab͕u ayi azọdawo ebe nsọ Gi. 19 Ayi aghọwo ndi I nāchighi site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, ndi anākpọkwasighi ha aha-Gi.

Aisaia 64

1 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na I gādọwa elu-igwe, ridata, ma asi na ugwu nile gēsi n'iru Gi rùda dika miri; 2 dika mb͕e ọku nāb͕a umu osisi, dika mb͕e ọku nēme ka miri b͕ọ: ime ka ndi nēmegide Gi mara aha-Gi, ka mba di iche iche we si n'iru Gi ma jijiji. 3 Mb͕e I mere ihe di egwu nke ayi nēleghi anya ha, I ridatara, ugwu nile siri n'iru-Gi rùda dika miri. 4 Ọbuná site na mb͕e ebighi-ebi gara aga madu anughi, ha anutaghi kwa na nti, anya ahughi kwa otù Chineke, ma ewezuga nání Gi, Nke nāluru onye nēchere Ya ọlu. 5 I zutewo onye nēwere obi-utọ alu ezi omume, bú ndi nēcheta Gi n'uzọ-Gi nile: le, Gi onwe-gi were iwe, ayi we mehie: nime ha ka ayi nọworo mb͕e ebighi-ebi, àgāzọputa kwa ayi? 6 Ayi we di ka onye ruru árú, ayi nile; na dika uwe emeruru emeru, otú a ka ezi omume nile ayi di: ayi we kpọnwua dika akwukwọ osisi, ayi nile; ajọ omume-ayi nēfepu kwa ayi, dika ifufe. 7 Ọ dighi kwa onye nākpọku aha-Gi, nke nākpọte onwe-ya ijide Gi: n'ihi na I zonariwo ayi iru-Gi, we me ka ayi b͕aze site n'aka ajọ omume nile nke ayi. 8 Ma ab͕ua a, Jehova, Nna-ayi ka I bu: ayi onwe-ayi bu urọ, Gi onwe-gi bu onye nākpu ayi; ọlu aka-Gi ka ayi nile bu. 9 Jehova, ewela iwe nke-uku, echeta-kwa-la ajọ omume rue mb͕e ebighi-ebi: le, biko, legide anya, ndi-Gi ka ayi nile bu. 10 Obodo nsọ Gi nile aghọwo ọzara, Zaion aghọwo ọzara, Jerusalem aghọwo ebe tọb͕ọrọ n'efu. 11 Ulo-ayi nke di nsọ nke ma-kwa-ra nma, ebe nna-ayi-hà toro Gi, aghọwo ihe nsure-ọku: ihe nile ayi anāchọsi ike aghọwo kwa nkpọnkpọ ihe. 12 Mb͕e anēme ihe ndia, Ì gējisi Onwe-gi ike, Jehova? Ì gāb͕a nkiti, we weda ayi n'ala nke-uku?

Aisaia 65

1 Ekwerem ka ndi nājughi ajuju chọm; ekwerem ka ndi nāchọsighm ike chọtam: asirim otù mba nke nākpọkughi aham, Lekwam. 2 Ab͕asawom akam abua ogologo ubọchi nile nye otù ndi nke nēwezuga onwe-ha, ndi nēje ije n'uzọ nādighi nma, nēso èchìchè nile nke aka ha; 3 bú ndi ahu nke nākpasum iwe n'irum mb͕e nile, nāchu àjà n'ubi nile agbara-ogige, nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu brick nile; 4 ndi nānọdu n'etiti ílì, nānọ kwa ọnọdu-abali n'ebe nile echebeworo na nzuzo; ndi nēri anu ezì, ofé nke ihe-árú di iche iche di kwa n'ihe-isi-ite nile ha; 5 ndi nāsi, Guzoro onwe-gi iche, abiarula nsom, n'ihi na edowom i ihe nsọ: ndia bu anwuru-ọku n'imim, ọku nke nēre ogologo ubọchi nile. 6 Le, ọ bu ihe edeworo n'akwukwọ n'irum: M'gaghi-agba nkiti, kama M'gākwughachi, e, M'gākwughachi n'obi-ha, 7 ajọ omume nile nke unu na ajọ omume nile nke ndi bu nna-unu n'otù, ka Jehova siri, bú ndi sureworo ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ugwu nile, takwam uta n'elu ugwu ntà nile: M'gēbu kwa uzọ tùa ọlu-ha n'obi-ha. 8 Otú a ka Jehova siri, Dika anāchọta manya-vine ọhu n'uyọkọ nkpuru-vine, ewe si, Ebibila ya, n'ihi na ngọzi di nime ya: otú a ka M'gēme N'ihi ndi-orùm, ka M'we ghara ibibi ha nile. 9 M'gēme kwa otù nkpuru ka o si na Jekob puta, na otù onye-nnweta nke ugwum nile ka o si na Juda puta: ndi M'rọputaworo ewe nweta ya, ndi-orùm gēbi kwa n'ebe ahu. 10 Sheron gāghọ kwa ebe-ita-nri nke ìgwè ewu na aturu, ndagwurugwu Ekoa gāghọ kwa ebe ìgwè ehi nāmakpu amakpu. diri ndim chọworom. 11 Ma unu onwe-unu ndi nārapu Jehova, ndi nēchezọ ugwu nsọm, ndi nēdoro Gad table n'usoro, ndi nāb͕ajuru Meni manya gwara ọgwa; 12 M'gāgukọta unu nye mma-agha, unu nile gēruru kwa ala ka ewe b͕ue unu; n'ihi na akpọrọm unu òkù, ma unu azaghm; ekwurum okwu, ma unu anughi; unu we me ihe jọrọ njọ n'anyam abua, ọ bu kwa ihe nke nātọghm utọ ka unu rọputara. 13 N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji kwue otú a, si, Le, ndi-orùm gēri ihe, ma agu gāgu unu onwe-unu: le, ndi-orùm gāṅu, ihe-ọṅuṅu, ma akpiri gākpọ unu onwe-unu nku: le, ndi-orùm gāṅuri ọṅu, ma ihere gēme unu onwe-unu: 14 le, ndi-orùm gēti nkpu ọṅù site n'obi di nma, ma unu onwe-unu gēti nkpu site n'ihe-nb͕u nke obi, unu gēsite kwa na ntiwa nke mọ-unu kwasi ákwá ike. 15 Unu gārapu aha-unu n'azu ighọrọ ndi M'rọputaworo ihe-ọb͕ub͕a-iyi, Onye-nwe-ayi Jehova gēme kwa ka i nwua; ma Ọ gākpọ ndi-orù-Ya aha ọzọ: 16 onye ahu nke nāgọzi onwe-ya n'uwa ewe gọzie onwe-ya nime Chineke nke ezi-okwu; onye ahu kwa nke nāṅu iyi n'uwa gēji Chineke nke ezi-okwu ṅua; n'ihi na echezọwo ahuhu mbu nile, na n'ihi na ezonariwo ha n'anyam abua. 17 N'ihi na, le, M'gaje ikè elu-igwe ọhu na uwa ọhu: agaghi-echeta kwa ihe mbu nile, ha agaghi-abata kwa n'obi. 18 Ma otú ọ di, ka obi tọ unu utọ, teghari-kwa-nu egwú ọṅù rue mb͕e ebighi-ebi n'ihi ihe nke Mu onwem nēkè: n'ihi na, le, M'nēkè Jerusalem ibu ihe nteghari-egwú-ọṅù, ndi-ya kwa, ibu ihe obi-utọ. 19 M'gēteghari kwa egwú ọṅù n'aru Jerusalem, obi gātọkwam utọ n'aru ndim: agaghi-anu kwa olu ikwa-ákwá nime ya ọzọ, ma-ọbu olu iti-nkpu. 20 Ọ dighi nwa ọhu nwuchuru anwuchu gēsite kwa n'ebe ahu ọzọ, ma-ọbu agadi nke nānọzughi ubọchi ndu-ya: n'ihi na nwata gānwu mb͕e ọ b͕ara ọgu arọ ise, agākọcha kwa onye-nmehie mb͕e ọ b͕ara ọgu arọ ise. 21 Ha gēwu kwa ulo, biri nime ha; ha gāku kwa ubi-vine, rie nkpuru-ha. 22 Ha agaghi-ewu ulo, onye ọzọ ebichie; ha agaghi-aku, onye ọzọ erie: n'ihi na dika ubọchi nile nke osisi si di, otú a ka ubọchi nile nke ndim gādi, ndi M'rọputaworo gēnwe kwa ihe aka-ha lutara mb͕e di anya nke-uku. 23 Ha agaghi-adọb͕u onwe-ha n'ọlu n'efu, ha agaghi-amu umu nye obi-ọlulọ-miri: n'ihi na nkpuru nke ndi Jehova gọziworo ka ha bu, ha na umu gēsi n'aru-ha puta. 24 O gēru kwa na, tutu ha akpọ, Mu onwem gāza; mb͕e ha onwe-ha nọ nēkwu okwu, Mu onwem gānu. 25 Anu-ọhia wolf na nwa-aturu gātakọ nri n'otù, ọdum gāta kwa ahihia dika ehi: ma agwọ, ájá gābu nri-ya. Ha agaghi-eme ihe ọjọ, ha agaghi-ebibi kwa, n'ugwu nsọm nile, ka Jehova siri.

Aisaia 66

1 Otú a ka jehova siri, Elu-igwe bu oche-ezem, uwa bu kwa ihe-nb͕akwasi-ukwum: àha ulo gini ka unu gēwurum? ma-ọbu àha ebe gini gābu ebe-izu-ikem? 2 N'ihi na ihe nile ndia ka akam meworo, ihe ndia nile ewe di, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: ma onye a ka M'gēlegide, ọbuná onye ewedara n'ala nke etib͕u-kwa-ra mọ-ya etib͕u, onye nāma kwa jijiji n'okwum. 3 Onye nēb͕u ehi di ka onye nētib͕u madu; onye ji nwa-aturu achu àjà di ka onye nāb͕aji olu nkita; onye nēsure àjà-nsure-ọku, bú onyinye-inata-iru-ọma, di ka onye nēsure ọbara ezì; onye nēsure frankincense ka ọ buru ihe-ncheta di ka onye nāgọzi ajọ ihe: e, ndi ahu arọputawo uzọ nile nke aka ha, ọ bu kwa ihe-árú nile ha nātọ nkpuru-obi-ha utọ; 4 Mu onwem gārọputa kwa ichì-ọchì nile ha, me kwa ka ihe-ujọ nile ha biakwasi ha; n'ihi na M'kpọrọ òkù, ma ọ dighi onye nāza; ekwurum okwu, ma ha anugh: ha we me ihe jọrọ njọ n'anyam, ọ bu kwa ihe ahu nke nātọghm utọ ka ha rọputara. 5 Nurunu okwu Jehova, unu ndi nama jijiji n'okwu-Ya: Umu-nne-unu ndi nakpọ unu asì, ndi nāchupu unu n'ihi aham, asiwo, Ka asọpuru Jehova, ka ayi we lekwasi ọṅù-unu anya: ma ihere gēme ndi ahu. 6 Ge nti, olu nkpọtu nēsite n'obodo, olu nēsite n'ulo uku Chineke, bú olu Jehova Onye nākwughachi ndi-iro-Ya nmeso-ha. 7 Tutu ime eme ya, ọ muru nwa; tutu ihe-nb͕u nke diri ya abia, ọ muputara nwa-nwoke. 8 Ònye nuworo ihe dika nka? ònye huworo ihe dika ndia? Ìme ala gēme ya n'otù ubọchi? àgāmu mba n'otù mb͕e? n'ihi na ime mere Zaion, ọ mu-kwa-ra umu-ya. 9 Mù onwem gēme ka nwa rue ọmumu, ghara ime ka amua ya? ka Jehova siri: ma-ọbu Mu onwem nke nēme ka amua, M'gēmechi àkpà-nwa? ka Chineke-gi siri. 10 Soronu Jerusalem ṅuria, teghari-kwa-nu egwú ọṅù n'ihi ya, unu ndi nile nāhu ya n'anya: ka obi tọ unu utọ n'ebe ọ nọ site n'obi-utọ, unu ndi nile nēru újú bayere ya: 11 ka unu we ṅujue ara nkasi-obi-ya nile afọ; ka unu we miputa ara, njubiga-ókè nke nsọpuru-ya ewe tọ unu utọ. 12 N'ihi na otú a ka Jehova siri, Le, M'nēsetiru ya udo dika osimiri, na nsọpuru nke mba di iche iche dika iyi nke nērubiga ókè, unu gāmiputa nime ha; n'akuku ka agēkuru unu, ọ bu kwa n'ikperè ka agātughari unu. 13 Dika onye nke nne-ya nākasi obi, otú a ka Mu onwem gākasi unu obi; ọ bu kwa nime Jerusalem ka agākasi unu obi. 14 Unu gāhu kwa ya, o we tọ obi-unu utọ, ọkpukpu nile unu gējuputa na ndu dika ahihia ndu: agāma kwa aka Jehova n'ebe ndi-orù-Ya nọ, Ọ gēwesa kwa ndi-iro-Ya iwe. 15 N'ihi na, le, Jehova gēji ọku bia, ub͕ọ-ala-Ya nile gādi kwa ka oké ifufe; iji ọnuma nyeghachi iwe-Ya, na iji ire ọku nyeghachi ibasi-nba-ike-Ya. 16 N'ihi na ọku ka Jehova gēji soro anu-aru nile, bú madu, je ikpé, Ọ gēji kwa mma-agha-Ya: ndi Jehova b͕uworo gaba uba. 17 Ndi nēdo onwe-ha nsọ ndi nēme onwe-ha ka ha di ọcha ibà n'ubi nile ab͕ara ogige, n'azu otù onye di n'etiti, ndi nēri anu ezì, na ihe-árú ahu, na òké; n'otù ka ha gāgwusi, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 18 Ma Mu onwem, amaram ọlu nile ha na èchìchè nile ha: mb͕e nābia ijikọta mba nile na asusu nile; ha gābia kwa, hu ebubem. 19 M'gēdo kwa ihe-iriba-ama n'etiti ha, si kwa n'etiti ha ziga ndi b͕aputara ab͕aputa ka ha jekuru mba nile, bú Tashish, na Pul, na Lud, ndi nādọ uta, jekuru Tubal na Jevan, jekuru agwe-etiti nile di anya, ndi nānughi ihe bayerem, ndi nāhughi kwa ebubem: ha gēgosi ebubem n'etiti mba nile. 20 Ha gēme kwa umu-nne-unu nile ka ha si na mba nile bia ibu onyinye-inata-iru-ọma enyere Jehova, n'elu inyinya, na n'ub͕ọ-ala, na n'ub͕ọ-ala nwere ihe-okpukpu, na n'elu inyinya mule, na n'elu anu di ngwa, rue ugwu nsọm, bú Jerusalém, ka Jehova siri, dika umu Israel si ewebata onyinye-inata-iru-ọma-ha n'ulo Jehova n'ihe di ọcha. 21 Ọ bu kwa ufọdu nime ha ka M'gēwere ibu ndi-nchu-àjà na ibu ndi Livai, ka Jehova siri. 22 N'ihi na dika elu-igwe ọhu na uwa ọhu, nke Mu onwem nēme, ganēguzo n'irum, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), otú a ka nkpuru-unu na aha-unu gēguzo. 23 Ọ gēru kwa, na site n'otù ọnwa ọhu rue ọnwa ọhu ọzọ, na site n'otù ubọchi-izu-ike rue ubọchi-izu-ike ọzọ, anu-aru nile, bú madu, gābia ikpọ isi ala n'irum, ka Jehova siri. 24 Ha gāpu kwa, lekwasi ozu nile nke ndi nējehie ejehie megidem: n'ihi na ikpuru-ha agaghi-anwu, ọku-ha agaghi-anyu kwa; ha gābu-kwa-ra anu-aru nile ihe isọ oyi.

Jeremaia 1

1 Okwu Jeremaia nwa Hilkaia, onye sitere na ndi-nchu-àjà ndi nọ n'Anatot n'ala Benjamim: 2 onye okwu Jehova ruru nti n'ubọchi Josaia nwa Emon, bú eze Juda, n'arọ nke-iri-na-atọ ọ bu eze. 3 O ru-kwa-ra ya nti n'ubọchi Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, rue mb͕e arọ nke-iri-na-otù nke Zedekaia nwa Josaia, bú eze Juda, gwusiri: rue mb͕e emere ka Jerusalem je biri n'ala ọzọ n'ọnwa nke-ise. 4 Okwu Jehova we ruem nti, si, 5 Tutu akpua m gi n'afọ amaram gi, ọ bu kwa tutu i si n'àkpà-nwa puta ka M'doro gi nsọ; ewerewom gi nye ka gi buru onye-amuma diri mba nile. 6 M we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! le, amaghm ikwu okwu, n'ihi na nwata ka m'bu. 7 Jehova we sim, Asila, Nwata ka m'bu: n'ihi na ọ bu onye ọ bula M'gēzì gi ka i gējekuru, ọ bu kwa ihe ọ bula M'genye gi n'iwu ka i gēkwu. 8 Atula egwu iru-ha: n'ihi na gi ka M'nọyere inaputa gi, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 9 Jehova we setipu aka-Ya, me ka o rutu ọnum: Jehova we sim, Le, etinyewom okwum nile n'ọnu-gi: 10 le, emewom gi ta ka i lekọta mba nile, lekọta kwa ala-eze nile, iropu, na ikwada, na ime ka ha la n'iyì, na itikpọ, na iwu ulo, na iku ihe. 11 Okwu Jehova we ruem nti, si, Gini ka gi onwe-gi nāhu, Jeremaia? M'we si, Nkpa-n'aka nke osisi almond ka m'nāhu. 12 Jehova we sim, I huwo nke-ọma: n'ihi na onye nāmu anya ka M'bu n'ebe okwum di ime ya. 13 Okwu Jehova we ruem nti nke ub͕ò abua, si, Gini ka gi onwe-gi nāhu? M'we si, Ite afunwuworo ọku n'okpuru ya ka m'nāhu; iru-ya site-kwa-ra n'Ugwu. 14 Jehova we sim, N'Ugwu ka agēsi tọpu ihe ọjọ idakwasi ndi nile bi n'ala nka. 15 N'ihi na, le, M'gaje ikpọ ab͕uru nile nke ala-eze nile nke Ugwu òkù, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta; ha gābia kwa, do, onye ọ bula oche-eze-ya, n'oghere ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem, na imegide mb͕idi-ya nile buruburu, na imegide obodo nile nke Juda. 16 M'gēkwu kwa okwu ikpem nile n'ebe ha nọ bayere ihe ọjọ ha nile; n'ihi na ha arapuwom, we surere chi ọzọ ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, kpọ kwa isi ala nye ọlu di iche iche nke aka-ha. 17 Ma gi onwe-gi, ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi, bilie, gwa ha ihe nile Mu onwem nēnye gi n'iwu: atula ujọ ha, ka M'we ghara ime ka i tu ujọ n'iru ha. 18 Ma Mu onwem, le, ewerewom i nye ta ibu obodo ewusiri ike, na ibu ide ígwè, na ibu mb͕idi ọla, imegide ala nka nile, imegide eze nile nke Juda, imegide ndi-isi-ya, imegide ndi-nchu-àjà-ya, na imegide ndi ala ahu. 19 Ha gēbuso kwa gi agha; ma ha agaghi-enwe ike imegide gi: n'ihi na gi ka M'nọyere, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), inaputa gi.

Jeremaia 2

1 Okwu Jehova we ruem nti, si, 2 Je, kpọ òkù na nti nke Jerusalem, si, Otú a ka Jehova siri, Echetawom n'ebe i nọ ebere nke mb͕e i nọ na nwata, ihu-n'anya nke mb͕e aluru gi ọhu: otú i jesorom n'ọzara, n'ala anāghaghi nkpuru. 3 Israel bu ihe nsọ Jehova nwere, nkpuru mbu nke ihe-ọmume-Ya: ikpe gāma ndi nile nke nēripia ya; ihe ọjọ gābiakwasi ha, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 4 Nurunu okwu Jehova, unu ulo Jekob, na ab͕uru nile nke ulo Israel: 5 otú a ka Jehova siri, Àjọ omume gini ka nna-unu-hà huworo n'arum, na ha esiwo n'ebe M'nọ je n'ebe di anya, we jeso ihe-efu, we ghọ ihe-efu? 6 Ha asighi kwa, Òle ebe Jehova nọ, bú Onye meworo ka ayi si n'ala Ijipt rigoputa; Onye meworo ka ayi je ije n'ọzara, n'ala nke ebe ihe nādighi na nke olùlù, n'ala ọkpọ-nku na nke onyinyo ọnwu, n'ala nke ọ nādighi onye gabigara nime ya, na nke madu nēbighi n'ebe ahu? 7 M'we me ka unu bata n'ala nke ubi ọma, iri nkpuru-ya na ezi ihe-ya: unu we bata, we merua alam, me ka ihe-nketam ghọ ihe-árú. 8 Ndi-nchu-àjà asighi, Òle ebe Jehova nọ? ọzọ, ndi ji iwum eme ihe amaghm: ndi-ọzùzù-aturu jehie-kwa-ra megidem, ndi-amuma ji-kwa-ra Beal bu amuma, ọ bu kwa ihe nādighi-abà urù ka ha jesoro. 9 N'ihi ya Mu na unu gēkpe kwa ikpe ọzọ, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), Mu na umu umu-unu gēkpe kwa ikpe. 10 N'ihi na, gabiganu rue agwe-etiti nile nke Kitim, we hu; ziga-kwa-nu na Kida, we chigharia uche nke-uku; hu-kwa-nu ma ihe di otù a adiwo. 11 Ọ̀ di mba ab͕anweworo chi di iche iche ha, ọ bu ezie na ihe ahu abughi chi? ma ndim ab͕anwewo nsọpuru-ha n'ihe nadighi-abà urù. 12 Ka ibodo ihe a nwu a unu n'aru, unu elu-igwe, tuanu oké ujọ, burunu ihe tọb͕ọrọ n'efu nke-uku, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 13 N'ihi na ihe ọjọ abua ka ndim meworo; Mu ka ha rapuworo, bú isi-iyi nke miri nēnye ndu, ka ha we gwuwara onwe-ha olùlù-miri di iche iche, bú olùlù-miri tipúru etipú, nke nānagideghi miri. 14 Israel, ọ̀ bu orù? ọ̀ bu orù amuru n'ulo ka ọ bu? gini mere o ji ghọ ihe-nluta-n'agha? 15 Ya ka umu-ọdum nāb͕o uja, ha ewewo ka olu-ha da udà: ha we me ka ala-ya ghọ ebe tọbọrọ n'efu; esuresiwo obodo-ya nile oku, ha we ghara inwe onye-obibi. 16 Ọzọ, umu Nof na Tahpanhes nērichapu opu-n'isi-gi. 17 Ọ̀ bughi nka ka i nēmere onwe-gi, n'irapu Jehova, bú Chineke-gi, mb͕e Ọ nēme ka i je ije n'uzọ? 18 Ma ub͕u a gini ka i nwere n'uzọ Ijipt, n'iṅu miri Shaihoa? ma-ọbu gini ka i nwere n'uzọ Asiria, n'iṅu miri nke Osimiri ahu? 19 Ihe ọjọ gi gādọ gi aka na nti, ndaghachi-azu-gi nile gāba-kwa-ra gi nba: ya mere mara, hu na ihe ọjọ na ihe di ilu ka ọ bu, na i rapuworo Jehova, bú Chineke-gi, oké egwum we ghara idi n'aru gi, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 20 N'ihi na site na mb͕e ebighi-ebi gara aga ka M'b͕ajiworo yoke-gi, tijie ab͕u-gi nile; i we si, M'gaghi-efè òfùfè; n'ihi na n'elu ugwu ntà ọ bula di elu nan'okpuru osisi ndu ọ bula ka gi onwe-gi nērulata onwe-gi, nākwa iko. 21 Ma Mu onwem kuru gi-ri osisi vine kachasi nma, nkpuru nke bu nání ihe ziri ezi: ì si kwa aṅa b͕anwe orù osisi vine nke ala ọzọ n'ebe M'nọ? 22 N'ihi na ọ buru na i ji akanwu sa aru, i were kwa n'onwe-gi ọtutu nchà, ma akaworo ajọ omume-gi n'irum, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 23 Ì gēsi aṅa si, Arughm árú, ejesoghm Bealim? le uzọ-gi na ndagwurugwu, mara ihe i meworo: i bu nwa-ab͕ọghọ-camel di nkọ nāb͕aghari n'uzọ-ya nile; 24 i bu nne-inyinya-ibu-ọhia nke mara ọzara aka; n'ọchichọ nke nkpuru-obi-ya o kubawo ifufe; na mb͕e ọbub͕a-ya ònye gēme ka ọ laghachi azu? ndi nile nke nāchọ ya agaghi-ada #mbà; n'ọnwa-ya ka ha gāchọta ya. 25 B͕ochie ukwu-gi n'ibà ukwu efu, b͕ochi kwa akpiri-gi n'ikpọ-nku: ma i siri, Ntukwasi-obi adigh: é-è; n'ihi na ahuwom ndi ala ọzọ n'anya, ha ka m'gējeso kwa. 26 Dika ihere onye-ori mb͕e anāchọputa ya, otú a ka emeworo ka ihere me ulo Israel; ha onwe-ha, na ndi-eze-ha, na ndi-isi-ha, na ndi-nchu-aja-ha, na ndi-amuma-ha; 27 ndi nāsi osisi, Nnam ka i bu; nāsi kwa nkume, Gi onwe-gi murum: n'ihi na ha ab͕akutawom azu, ha echeghm iru: ma na mb͕e ọnọdu ọjọ ha ha gasi, Bilie, we zọputa ayi. 28 Ma òle ebe chi-gi nile nke i meworo nye onwe-gi nọ? ka ha bilie, ọ buru na ha gāzọputa gi na mb͕e ọnọdu ọjọ gi: n'ihi na dika ọnu-ọgugu obodo-gi nile si di, otú a ka chi-gi nile di, Juda. 29 N'ìhi gini ka unu nārusom uka? unu nile ejehiewo megidem, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 30 N'efu ka M'tib͕uworo umu-unu; ọ dighi ọdidọ-aka-na-nti ha natara: mma-agha-unu erichapuwo ndi-amuma-unu, dika ọdum nke nēbibi ebibi. 31 Unu ọb͕ọ a, unu onwe-unu le Jehova. Ọ̀ bu ọzara ka M'buworo Israel? ma-ọ̀bu ala nke oké ọchichiri? gini mere ndim ji si, Ayi lupuru alupu; ayi agaghi-abiakute Gi ọzọ? 32 Nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, ọ̀ gēchezọ ihe-ichọ-nma-ya? nwayi aluru ọchu, ọ̀ gēchozọ ihe ike n'úkwù-ya? ma ndim echezọwom ubọchi nādighi ọnu-ọgugu. 33 Gini mere i ji eme ka uzọ-gi di nma ichọ ihu-n'anya? n'ihi ya ọbuná ndinyom ọjọ ka i zíworo uzọ-gi nile. 34 Ọzọ, n'ọnu-ọnu-uwe-gi ka achọtaworo ọbara nke nkpuru-obi nke ndi-ob͕eye nēmeghi ihe ọjọ: ọ bughi na ntipú-ulo ka i chọtara ha, kama ọ bu n'ihi ihe ndia nile. 35 Ma i siri, Emeghm ihe ọjọ; n'ezie iwe-Ya esiwo n'arum laghachi. Le, Mu na i ganēje n'ikpé, n'ihi na i siri, Emehieghm. 36 Gini mere i ji kpaghari nke-uku ib͕anwe uzọ-gi? ihere Ijipt gēme kwa gi, dika ihere Asiria mere gi. 37 Ọbuná n'ala nka ka i gēsi pua, aka-gi abua adi kwa n'isi-gi: n'ihi na Jehova ajuwo ihe-ntukwasi-obi-gi nile, ọ gaghi-aga-kwa-ra gi nke-ọma nime ha.

Jeremaia 3

1 Ọ si, Le, ọ buru na nwoke achupu nwunye-ya, nwayi ahu ewe si n'ebe ọ nọ la, we ghọ nwunye nke nwoke ọzọ, di mbu ya, ọ̀ gālu kwa ya ọzọ? àgaghi-emeru ala ahu emeru nke-uku? Ma gi onwe-gi akwawo iko, gi na ọtutu ndi-iko: ì si na i gālaghachikutem? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 2 Welie anya-gi abua le ebe nile di elu nke ọhia nādighi, hu; òle ebe gi na ndikom nēdinakọtaghi? N'uzọ nile ka i nọworo nēle anya ha, dika onye Arebia n'ọzara; i we were ikwa-iko-gi nile, were kwa ihe ọjọ gi, merua ala. 3 Ewe b͕ochie oké miri-ozuzo nile, miri-ozuzo ikpe-azu adighi kwa; ma egedege-iru nke nwayi nākwa iko ka i nwere, i juru ka etiye gi n'ọnọdu-ihere. 4 Ì sighi na mb͕e a kpọkuem, si, Nnam, di m'nwere n'ab͕ọghọ ka I bu? 5 Ọ̀ gēchebe iwe-Ya rue mb͕e ebighi-ebi? Ọ̀ gēdebe ya rue ọgwugwu ihe nile? Le, i kwuwo otú a, i we me ihe ọjọ gi nile, we nwe ike. 6 Jehova we sim n'ubọchi Josaia, bú eze, Ì huwo ihe Israel nke nādaghachi azu meworo? nwayi ahu nēje n'elu ugwu ọ bula di elu, na n'okpuru osisi ndu ọ bula, we nākwa iko n'ebe ahu. 7 M'we si, mb͕e ọ mesiri ihe ndia nile, Ya laghachikutem; ma ọ laghachigh: nwa-nne-ya nke nāghọb͕u, bú Juda, we hu ya. 8 M'we hu na, mb͕e M'chupusiri Israel, nye ya akwukwọ nkewa-ya n'ihi ihe ndia nile, bú na Israel nke nādaghachi azu kwarari iko, na nwa-nne-ya nwayi nke nāghọb͕u aghọb͕u, Juda atughi egwu; ọ we je kwa iko, ọbuná ya onwe-ya. 9 O rue, site n'idi-nfe nke ikwa-iko-ya, na emeruru ala-ya, ọ we kwaso nkume, kwaso kwa osisi, iko. 10 Ma ọbuná n'ihe a nile nwa-nne-ya nwayi nke nāghọb͕u, bú Juda, ejighi obi-ya nile laghachikutem, kama o ji okwu-ugha, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 11 Jehova we sim, Israel nke nādaghachi azu egosiwo onwe-ya onye ezi omume kari Juda nke nāghọb͕u aghọb͕u. 12 Je, kpọsa okwu ndia n'uzọ Ugwu, si, Lata, gi Israel nke nādaghachi azu, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta; M'gaghi-edo unu iru iwe: n'ihi na onye-ebere ka M'bu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gaghi-edebe iwe rue mb͕e ebighi-ebi. 13 Nání mara ajọ omume-gi, na ọ bu Jehova, bú Chineke-gi, ka i jehieworo megide, i we wasara ndi ala ọzọ uzọ-gi nile n'okpuru osisi ndu ọ bula, ma olum ka unu nēgeghi nti, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 14 Latanu, umu nke nādaghachi azu, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta; n'ihi na Mu onwem bu di nwe unu: M'gēwere kwa unu, otù site n'otù obodo, abua site n'otù ab͕uru, M'gēme kwa ka unu biarue Zaion: 15 M'gēnye kwa unu ndi-ọzùzù-aturu dika obim si di, ndi gēji ihe-ọmuma na inwe-uche azù unu. 16 O gēru kwa, mb͕e unu baworo uba, mu kwa ọmùmù n'ala-unu, n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na ha agaghi-asi ọzọ, Ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova; ọ gaghi-abà kwa n'obi: ha agaghi-echeta kwa ya; ha agaghi-eleta kwa ya; agaghi-eme kwa ya ọzọ. 17 Na mb͕e ahu ka ha gākpọ Jerusalem oche-eze Jehova; agāchikọta kwa mba nile rue ya, inye aha Jehova, rue Jerusalem: ha agaghi-ejeso kwa isi-ike nke obi ọjọ ha. 18 N'ubọchi ahu ulo Juda gējekuru ulo Israel, ha gāyikọ kwa bia site n'ala Ugwu rue ala ahu nke M'mere ka nna-unu-hà keta. 19 Ma Mu onwem siri, M'gēsi aṅa tiye gi n'etiti umu, we nye gi ala anāchọsi ike, ihe-nketa nke mara nma nke usu nile nke mba di iche? M'we si, Nnam ka unu gākpọm; unu agaghi-esi kwa n'isom laghachi azu. 20 N'ezie dika nwayi si ewere nghọb͕u rapu di-ya, otú a ka unu ghọb͕uworom, unu ulo Israel; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 21 Olu ka anuru n'elu ebe nile di elu nke ọhia nādighi, bú ikwa-ákwá na aririọ-amara nile nke umu Israel; n'ihi na ha emewo ka uzọ-ha gbagọ, ha echezọwo Jehova, bú Chineke-ha. 22 Latanu, umu nke nādaghachi azu, M'gāgwọ ndaghachi-azu nile nke unu. Le ayi anya, ayi abiakutewo Gi; n'ihi na Gi onwe-gi bu Jehova, bú Chineke-ayi. 23 N'ezie n'efu ka nzọputa ahu bu nke anēle anya ya site n'ugwu ntà di iche iche, bú ìgwè madu n'elu ugwu nile: n'ezie na Jehova, bú Chineke-ayi, ka nzọputa Israel di. 24 Ma ihe-ihere ahu erichapuwo ihe putara na ndọb͕u nna-ayi-hà dọb͕uru onwe-ha n'ọlu site na mb͕e ayi di na nwata; ìgwè ewu na aturu-ha na ìgwè ehi-ha, na umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom. 25 Ka ayi dina ala n'ihere-ayi, ka ọnọdu-ihere etiyere ayi nime ya kpuchi kwa ayi: n'ihi na Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi mehieworo megide, ayi onwe-ayi na nna-ayi-hà, site na mb͕e ayi di na nwata we rue ta: ayi egeghi kwa nti n'olu Jehova, bú Chineke-ayi.

Jeremaia 4

1 Ọ buru na i gālata, gi Israel, (ọ bu ihe si nọnu Jehova puta), Mu ka i gālaghachikute: ọ buru kwa na i gēwezuga ihe-árú-gi nile n'irum, i gaghi-awaghari; 2 i gāṅu kwa iyi, Jehova nādi ndu, n'ezi-okwu, na n'ikpé ziri ezi, na n'ezi omume; mba nile gāgọzi kwa onwe-ha nime Ya, ọ bu kwa nime Ya ka ha gānya isi. 3 N'ihi na otú a ka Jehova siri ndikom Juda, si kwa Jerusalem, Lucharanu onwe-unu ubi, unu agha-kwa-la nkpuru n'etiti ogwu. 4 Bìenu onwe-unu úgwù nye Jehova, bìenu onwe-unu úgwù n'obi, unu ndikom Juda na ndi bi na Jerusalem: ka ọnuma m we ghara ipu dika ọku, we re nke ọ nādighi onye nēmenyu, site n'ihe ọjọ nke omume nile unu. 5 Gosinu na Juda, me-kwa-nu ka anuru ya na Jerusalem; si-kwa-nu, Fùanu opì-ike n'ala nka: kpọzuenu nkpu, si, Chikọtanu onwe-unu, ka ayi ba kwa n'obodo nile ewusiri ike. 6 Bulienu ọkọlọtọ n'uzọ Zaion: latanu n'ulo ọsọsọ, unu eguzola: n'ihi na ihe ọjọ ka Mu onwem nēme ka o si n'Ugwu bia, ya na ntipia uku. 7 Ọdum esiwo n'alughi-ulù-ya rigo, bú onye nēbibi mba di iche iche; o buliwo ije-ya, o siwo n'ọnọdu-ya puta; ime ka ala-gi ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu; obodo-gi nile gāghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ghara inwe onye-obibi. 8 N'ihi nka kenu ákwà-nkpe n'úkwù-unu, tienu aka n'obi, kwasi kwa ákwá ike: n'ihi na iwe di ọku nke Jehova esighi n'aru ayi laghachi. 9 O gēru kwa n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na obi eze gāla n'iyì, ya na obi ndi-isi; ibobo gānwu kwa ndi-nchu-aja n'aru, ọ gāb͕agwoju kwa ndi-amuma anya. 10 M'we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! n'ezie I rafuwo ndi nka na Jerusalem nke-uku, si, Udo gādiri unu, ma mma-agha emetuwo nkpuru-obi aru. 11 Na mb͕e ahu ka agāsi ndi nka, si kwa Jerusalem, Ifufe di ọku, nke sitere n'ebe di elu nke ọhia nādighi ya nke di n'ọzara, nēfe n'uzọ ada ndim, ọ bughi ifucha afucha, ọ bughi kwa ime ka adi ọcha; 12 ifufe nke juru eju nke sitere n'ebe ndia gābiaram: ub͕u a Mu onwem gēkwu kwa ọkwu ikpé nile n'ebe ha nọ. 13 Le, dika igwe-oji ka ọ nārigota, ọ bu kwa dika oké ifufe ka ub͕ọ-ala-ya nile di: inyinya-ya nile di garagara kari ugo. Ahuhu gādiri ayi! n'ihi na ebibiwo ayi. 14 Sapu obi-gi n'ihe ọjọ, gi Jerusalem, ka ewe zọputa gi. Rùe ole mb͕e ka i gēme ka ajọ èchìchè-gi nile nọ ọnọdu-abali n'etiti gi? 15 N'ihi na otù olu nēgosi site na Dan, ọ nēme kwa ka anuru ajọ ihe site n'ugwu Efraim: 16 hotaranu mba nile; le, menu ka anuru ya megide Jerusalem, si, na ndi-nche nābia site n'ala di anya, ha we me ka olu-ha da megide obodo nile nke Juda. 17 Dika ndi nēdebe ubi, otú a ka ha nọ nēmegide ya buruburu; n'ihi na Mu ka ọ nupuworo isi n'okpuru, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 18 Uzọ-gi na omume-gi nile ewewo gi ihe ndia; nka bu ihe ọjọ gi; n'ihi na ọ di ilu, n'ihi na o rutuwo obi-gi aru. 19 Ngiri-afọm, ngiri-afọm! anamab͕ali na mb͕idi nile nke obim; obim nāsu udè nke-uku nimem; adighm-ab͕a nkiti; n'ihi na olu opì-ike ka i nuworo, nkpuru-obim, bú udà-opì agha. 20 Ntipia n'elu ntipia ka anākpọ; n'ihi na ebibiwo ala nka nile: na mberede ka ebibiworo ulo-ikwūm nile, n'otù ntabi-anya ka ebibiworo ákwà-nkwubam nile. 21 Rùe ole mb͕e ka m'gāhu ọkọlọtọ, nu olu opì-ike? 22 N'ihi na ndi uche-ha b͕agọrọ ab͕agọ ka ndim bu, Mu ka ha nāmaghi; umu di nzuzu ka ha bu, ndi nādighi-aghọta ihe ka ha bu: ndi mara ihe ka ha bu n'ime ihe ọjọ, ma ime ezi ihe ka ha nāmaghi. 23 Ahurum uwa, ma, le, ọ bu ihe tọb͕ọrọ n'efu na ihe tob͕oro nkiti; ahu-kwa-ram elu-igwe, ma ìhè-ha adighi. 24 Ahurum ugwu, ma, le, ha nāma jijiji, ugwu ntà nile me-kwa-ra nkapatu. 25 Ahurum, ma, le, ọ dighi madu di, anu-ufe nile nke elu-igwe efelawo kwa. 26 Ahurum, ma, le, ubi ọma bu ọzara, akwatusi-kwa-ra obodo-ya nile n'iru Jehova, n'iru iwe-Ya di ọku. 27 N'ihi na otú a ka Jehova siri, Ebe tọb͕ọrọ n'efu ka ala nka nile gābu; ma M'gaghi-eme ka ọ gwusia. 28 N'ihi nka ka uwa gēru újú, elu-igwe nke di n'elu gēji kwa nji: n'ihi na ekwubewom, ezubewom, echègharighkwam, M'gaghi-esi kwa nime ya laghachi azu. 29 Site n'olu ndi-inyinya na ndi-ọb͕a-uta obodo a nile nāb͕alaga; ha abawo n'ọhia b͕ara ọchichiri, ọ bu kwa na nkume nile di elu ka ha rigoworo: obodo ọ bula ka arapuworo, ọ dighi kwa onye ọ bula nēbi nime ha. 30 Ma gi onwe-gi, mb͕e ebibiworo gi, gini ka i gēme? Mb͕e i geyi uwe uhie, mb͕e i gēke ihe-ichọ-nma ọla-edo, mb͕e i gēji ihe-ichọ-nma me ka anya-gi abua sa mbara, n'efu ka i nēme onwe-gi ka i ma nma; ndi-iko-gi ajuwo gi, ndu-gi ka ha nāchọ. 31 N'ihi na olu dika nke nwanyi ime nēme ka m'nuworo, ihe-nb͕u dika nwanyi nāmu nwa mbu ya, bú olu nke ada Zaion, o nēku ike ike, ọ nāb͕asa ọbu-aka-ya abua, si, Ahuhu dirim nọ̄! n'ihi na nkpuru-obim nāda #mbà n'iru ndi-ob͕u-madu.

Jeremaia 5

1 Jegharianu n'èzí nile nke Jerusalem, biko, hunu, we mara, chọ-kwa-nu n'amá-ya nile, ma ọ buru na unu gāchọta nwoke ọ bula, ọ buru na ọ di onye nēme ihe ekpere n'ikpé, onye nāchọ ikwesi-ntukwasi-obi; M'gāb͕aghara kwa obodo a. 2 Ma ọ buru na ha asi, Jehova nādi ndu; n'ezie n'okwu-ugha ka ha na-aṅu iyi. 3 Jehova, ànya-Gi abua adighi n'ebe ikwesi-ntukwasi-obi di? I tiwo ha ihe, ma o wutaghi ha; I mewo ka ha gwusia, ma ha ajuwo inara idọ-aka-na-nti: ha emewo ka iru-ha di ike nkume; ha ajuwo ilata. 4 Mu onwem we si, N'ezie ndi nēnweghi ike ka ha bu: ha b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha; n'ihi na ha amaghi uzọ Jehova, na ikpé nke Chineke-ha: 5 ka M'jekuru ndi uku, gwa ha okwu; n'ihi na ndi ahu mara uzọ Jehova, na ikpé nke Chineke-ha. Ma ndi ahu ab͕ajiwo yoke n'otù, tijie ab͕u nile. 6 N'ihi ya ọdum nke sitere n'oké ọhia gētib͕u ha, anu-ọhia wolf nke ala ihe nādighi gēbibi ha, agu ganēche obodo nile ha anya, agādọb͕u onye ọ bula nke nāpu nime ha: n'ihi na njehie-ha di ọtutu, ndaghachi-azu nile nke ha di kwa ike. 7 M'gēsi kwa aṅa b͕aghara gi? umu-gi arapuwom, we were ihe nābughi chi ṅu iyi: mb͕e M'mere ka ha rijue afọ, ha we kwa iko, ọ kwa n'ulo nwanyi nākwa iko ha nēdo onwe-ha n'usu ndi nāpunara madu ihe. 8 Inyinya azùru azù nke-oma nke nāb͕à nne-inyinya ka ha bu: nwoke ọ bula nime ha nēbeso nwunye madu-ibe-ya. 9 M'gaghi-eleta n'ihi ihe ndia? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: nkpuru-obim, ọ̀ gaghi-abọ̀ kwa mba nke di otú a ọ́bọ̀? 10 Rigonu n'elu mb͕idi-ya nile, bibie; ma unu emela ka ọ gwusia: wezuganu alaka-ya nile: n'ihi na ọ bughi ihe Jehova nwere ka ha bu. 11 N'ihi na ulo Israel na ulo Juda aghọb͕uwom nke-uku, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 12 Ha agọnariwo Jehova, si, Ọ bughi Ya; ihe ọjọ agaghi-abiakwasi kwa ayi; ayi agaghi-ahu kwa mma-agha na oké unwu: 13 ndi-amuma gāghọ kwa ifufe, okwu-Ya adighi kwa nime ha: otú a ka agēme ha. 14 N'ihi nka ka Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, ji si otú a, N'ihi unu nēkwu okwu a, le, anameme okwum nke di n'ọnu-gi ka ha ghọ ọku, anameme kwa ka ndi ghọ nkú, ọ gērichapu kwa ha. 15 Le, anameme ka otù mba si n'ebe di anya biakwasi unu, ulo Israel, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: ) mba di ike ka ọ bu, mba nke sitere na mb͕e ebighi-ebi gara aga ka ọ bu, ọ bu mba nke i nādighi-ama asusu-ya, nke I nādighi-anu kwa ihe ha nēkwu. 16 Àkpà-àkú-ha di ka ílì ghere oghe, ha nile bu ndi-dike. 17 Ha gērichapu kwa owuwe-ihe-ubi-gi, na nri-gi, nke umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom nēri: ha gērichapu ìgwè ewu na aturu-gi na ìgwè ehi-gi: ha gērichapu osisi vine gi na osisi fig i: ha gēji mma-agha titu obodo-gi nile ewusiri ike, nke gi onwe-gi nātukwasi ha obi. 18 Ma ọbuná n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gaghi-eme ka unu gwusia. 19 Ọ gēru kwam mb͕e unu gāsi, N'ìhi gini ka Jehova, bú Chineke-ayi, meworo ayi ihe nile ndia? na i gāsi ha, Dika unu rapurum, we fè chi di iche iche nke ala ọzọ n'ala-unu, otú a ka unu gēfè ndi ala ọzọ n'ala nābughi nke unu. 20 Gosinu nka n'ulo Jekob, me kwa ka anuru ya nime Juda, si, 21 Biko, nurunu nka, unu ndi di nzuzu, nke obi amam-ihe nādighi; anya abua ka ha nwere, ma ha adighi-ahu uzọ; nti abua ka ha nwere, ma ha adighi-anu ihe: 22 ọ̀ bu Mu ka unu nādighi-atu egwum? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: ọ̀ gaghi-eb͕u unu nb͕u n'ihi irum? Mu onye doworo ájá ibu ókè nke oké osimiri, site n'ukpuru ebighi-ebi, ọ gaghi-agabiga kwa ya, ọ bu ezie na nmali-miri-ya nile nāmaghari, ma ha apughi; ọ bu ezie na ha nēbib͕o, ma ha adighi-agabiga ya. 23 Ma ndi nka nwere obi nēwezuga onwe-ya nānupu kwa isi; ha ewezugawo onwe-ha, we la. 24 Ha asighi kwa n'obi-ha, Biko, ka ayi tua egwu Jehova, bú Chineke-ayi, Onye nēnye oké miri-ozuzo, ma nke-mbu ma nke-ikpe-azu, na mb͕e-ya; ízù nile akara àkà nke owuwe-ihe-ubi ka Ọ nēdebere ayi. 25 Ajọ omume nile unu ewezugawo ihe ndia, nmehie nile unu eb͕ochiwo-kwa-ra unu ezi ihe. 26 N'ihi na ahuwo ndi nēmebi iwu n'etiti ndim: ha nēle anya buruburu, dika ndi-osi-ọnyà si eche anwu; ha esiwo ọnyà, ọ bu madu ka ha nānwude. 27 Dika nkata nnunu si ejuputa n'anu-ufe, otú a ka ulo nile ha juputara n'aghughọ: n'ihi nka ka ha ghọworo ndi uku, we buru ọgaranya. 28 Ha amawo abuba, aru-ha eb͕uwo àmùmà: e, emebigawo ihe ọjọ ókè: ha ekpeghi ọnu, bú ọnu nke nwa-nb͕ei, ka o we gara ha nke-ọma; ọ bu kwa ikpe nke ndi-ob͕eye ka ha nādighi-ekpe. 29 M'gaghi-eleta n'ihi ihe ndia? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: nkpuru-obim, ọ̀ gaghi-abọ̀ kwa mba nke di otú a ọ́bọ̀? 30 Ihe-iju-anya na ihe jọb͕uru onwe-ya emewo n'ala; 31 ndi-amuma ebuwo amuma ugha, ndi-nchu-àjà nāzọda kwa ndim site n'aka-ha; ndim ahuwo kwa ihe di otú a n'anya: ma gini ka unu gēme n'ikpe-azu-ya?

Jeremaia 6

1 Laghachinu n'ulo ọsọsọ, unu umu Benjamim, site n'etiti Jerusalem, fù-kwa-nu opì-ike nime Tekoa, buli-kwa-nu ihe-nbuli n'elu Bet-hakarem: n'ihi na ihe ọjọ si n'Ugwu eleputa anya, ya na ntipia uku. 2 Nwayi ahu nke mara nma nke di kwa pekepeke, bú ada Zaion, ka M'gēme ka ọ la n'iyì. 3 Ya ka ndi-ọzùzù-aturu na ìgwè aturu-ha gābiaru; ha ga-ama ulo-ikwū-ha n'akuku ya buruburu; ha gāzù aturu-ha, onye ọ bula n'ọnọdu nke aka ya. 4 Donu agha nsọ imegide ya; bilienu, ka ayi rigo n'etiti-ehihie. Ahuhu diri ayi! n'ihi na chi eruruwo, n'ihi na onyinyo anyasi nēsetipu onwe-ha. 5 Bilienu, ka ayi rigo n'abali, ka ayi bibie ulo-elu-ya nile. 6 N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Gbutuenu osisi-ya nile, wukọta obo-ihe imegide Jerusalem: nka bu obodo ahu agēleta; ọ bu nání nmeb͕u n'etiti ya. 7 Dika olùlù-miri si asuputa miri-ya, otú a ka obodo ahu suputaworo ihe ọjọ ya: ihe-ike na ipunara-madu-ihe ka anānu nime ya; n'irum mb͕e nile ka ọria na ọnyá-ntiputa di. 8 Ka adọ gi aka na nti, Jerusalem, ka nkpuru-obim we ghara ikewapu n'ebe i nọ; ka M'we ghara ime gi ebe tọb͕ọrọ n'efu, ala onye ọ bula nēbighi. 9 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Ha gātutukọsi ndi Israel fọduru dika esi atutukọ nkpuru-vine fọduru: seghachi aka-gi dika ọghọ-nkpuru-vine n'elu alaka nile. 10 Ònye ka M'gāgwa okwu, b͕a kwa àmà, ka ha we nu? le, ihe anēbighi ùgwù ka nti-ha bu, ha apughi kwa iṅa nti: le, okwu Jehova aghọworo ha ihe-ita-uta; ọ dighi-atọ ha utọ. 11 Ma ọnuma Jehova juputara nimem; ike gwurum inagide ya: wukwasi ya n'aru umu-ntakiri n'èzí, na n'aru ìzù umu-okorọbia n'otù: n'ihi na agēwere kwa ma di ma nwunye, ma okenye ma onye juputara n'ubọchi ndu-ya. 12 Agēme kwa ulo nile ha ka ha ghọ ihe ndi ọzọ, ubi-ha na ndinyom-ha n'otù: n'ihi na M'gēseti akam n'aru ndi bi n'ala nka, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 13 N'ihi na site n'onye dikarisiri ntà nime ha we rue onye dikarisiri uku nime ha onye ọ bula bu onye akpiri urù nēzighi ezi nākpọ nku; ọzọ, site n'onye-amuma we rue onye-nchu-aja onye ọ bula nēme ihe n'ugha. 14 Ha we gwọ nb͕aji ukwu na aka nke ndim nākpọghi ya ihe, si, Udo, udo; mb͕e udo nādighi. 15 Ọ̀ di ihere mere ha mb͕e ha mere ihe-árú? é-è, ihere adighi-eme ha ma-ọli, ọ dighi kwa itiye-n'ọnọdu-ihere ha mara: n'ihi nka ha gāda n'etiti ndi nāda ada: na mb͕e M'letara ha ha gāsu ngọngọ, ka Jehova siri. 16 Otú a ka Jehova siri, Guzonu n'uzọ nile, hu, ju-kwa-nu ajuju bayere okoporo-uzọ nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga, si, Òle ebe ezi uzọ di kwa? je-kwa-nu ije nime ya, we chọtara nkpuru-obi-unu izu-ike. Ha we si, Ayi agaghi-eje ije nime ya. 17 Eme-kwa-ram ka ndi-nche biliere unu, si, Ṅanu nti olu opì-ike; ha we si, Ayi agaghi-aṅa nti. 18 N'ihi nka nurunu, unu mba nile, mara kwa, unu nzukọ, ihe di n'etiti ha. 19 Nuru, gi uwa: le, Mu onwem nēme ka ihe ọjọ biakwasi ndi nka, bú nkpuru nke èchìchè nile ha, n'ihi na okwum nile ka ha nāṅaghi nti; iwum kwa, ha ajuwo ya. 20 N'ìhi gini kwa ka frankincense ji biakutem site na Sheba, calamus ọma kwa site n'ala di anya? àjà-nsure-ọku-unu, ha abughi ihe natọ utọ, àjà-unu kwa, ha atọghm utọ. 21 N'ihi nka ka Jehova ji kwue otú a, si, Le, M'ganētiye ihe-isu-ngọngọ di iche iche n'iru ndi nka: nna na umu-ha gāsukwasi kwa ha ngọngọ; onye-ab͕ata-obi na eyì-ya gāla n'iyì. 22 Otú a ka Jehova siri, Le, otù ndi nēsi n'ala Ugwu bia: mba uku ka agākpọte kwa site na nsọtu nile nke uwa. 23 Uta na ube ka ha nējide; mba di irè ka ọ bu, ha adighi-enwe obi-ebere; olu-ha nēbib͕o dika okè osimiri, ọ bu kwa inyinya ka ha nānọkwasi; edoro mba ahu n'usoro, dika onye nēbu agha, imegide gi, ada Zaion. 24 Ayi anuwo ùdé-ya; aka-ayi akudawo: ihe-nb͕u ejidewo ayi, ihe-nb͕ali dika nke nwayi ime nēme. 25 Apula ibà n'ọhia, eje-kwa-la ije n'uzọ; n'ihi na onye-iro nwere mma-agha, ujọ di buruburu. 26 Ada nke ndim, ke ákwà-nkpe n'úkwù-gi, turua onwe-gi na ntu: mere onwe-gi oruru-újú dika nke nwa-nwoke enwere nání ya, bú iti-aka-n'obi di ilu nke-uku; n'ihi na ọ bu na mberede ka onye nāpunara madu ihe gābiakwasi ayi. 27 Onye-ọnwunwa-ọla ka M'boro gi n'etiti ndim, ya na ebe ewusiri ike; ka i we mara nwa kwa uzọ-ha. 28 Ha nile bu ndi nēwezuga onwe-ha nke-uku, nējeghari dika onye nāb͕a àmà ọjọ: ọla na ígwè ka ha bu: ndi ahu nile bu ndi-nbibi. 29 Eko erewo ọku; ọku erechapuwo opi: n'efu ka ha nuchaworo nke-uku; n'ihi na anuchapughi ndi ọjọ. 30 Ọla-ọcha ajuru aju ka akpọrọ ha, n'ihi na Jehova ajuwo ha.

Jeremaia 7

1 Okwu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, si, 2 Guzo n'ọnu-uzọ-ama ulo Jehova, we kpọsa okwu a n'ebe ahu, si, Nurunu okwu Jehova, unu Juda nile, ndi nābà n'ọnu-uzọ-ama ndia ikpọ isi ala nye Jehova. 3 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri, Menu ka uzọ nile nke unu na omume nile nke unu di nma, M'gēme kwa ka unu biri n'ebe a. 4 Unu atukwasila obi-unu n'okwu-ugha nile, si, Ulo uku Jehova, ulo uku Jehova, ulo uku Jehova, ka ndi a bu. 5 N'ihi na ọ buru na unu eme ka uzọ nile unu na omume nile unu dizue nma; ọ buru na unu emezue ihe ekpere n'ikpe n'etiti otù onye na ibe-ya; 6 ọ buru na unu adighi-emeb͕u ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwanyi di-ya nwuru, ọ buru kwa na unu adighi-awusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ n'ebe a, ọ buru kwa na unu adighi-ejeso chi ọzọ di iche iche ime onwe-unu ihe ọjọ: 7 M'gēme kwa ka unu biri n'ebe a, n'ala nka nke M'nyere nna-unu-hà, site na mb͕e ebighi-egi gara aga we rue mb͕e ebighi-ebi di n'iru. 8 Le, unu onwe-unu nātukwasi obi-unu n'okwu-ugha nile, o we ghara ibara unu urù. 9 Ùnu ganēzu ori, nēb͕u madu, nākwa iko, nāṅu iyi ugha, nēsurere Beal ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, nējeso chi ọzọ di iche iche nke unu nāmaghi, 10 we bia guzo n'irum n'ulo a, nke akpọkwasiri aham, si, Anaputawo ayi; ka unu we me ihe-árú ndia nile? 11 Ọ̀ bu ọb͕à ndi nēme ihe-ike ka ulo a, nke akpọkwasiri aham, ghọworo n'anya-unu? Ọbuná Mu onwem, le, ahuwom ya, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 12 Otú ọ di, biko, jeruenu ọnọdum nke di na Shailo, ebe M'mere ka aham biri na mbu, hunu ihe M'mere ya n'ihi ihe ọjọ nke ndim, bú Israel. 13 Ma ub͕u a, n'ihi na unu aluwo ọlu ndia nile, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'we gwa unu okwu, nēbili n'isi-ututu nēkwu, ma unu anughi; M'we kpọ unu òkù, ma unu azagh: 14 M'gēme kwa ulo a, nke akpọkwasiri aham, nke unu onwe-unu nātukwasi obi, M'gēme kwa ọnọdu a nke M'nyere unu, nye kwa nna-unu-hà, M'gēme ha dika M'gēme ha dika M'mere Shailo. 15 M'gēsi kwa n'irum tufue unu, dika M'tufuru umu-nna-unu nile, bú nkpuru nile nke Efraim. 16 Ma gi onwe-gi, ekpela ekpere bayere ndi nka, ebuli-kwa-la iti-nkpu na ikpe-ekpere bayere ha, ariọ-kwa-lam aririọ: n'ihi na M'gaghi-anānu olu-gi. 17 Ì dighi-ahu ihe ndi ahu nēme n'obodo nile nke Juda na n'èzí nile nke Jerusalem? 18 Umu-ha nāchikọta nkú, ndi bu nna nāfunwu ọku, ndinyom-ha nāgwọ utu ọka flour koro eko, imere eze-nwanyi nke elu-igwe achicha, na iwusiri chi ọzọ di iche iche àjà-ihe-ọṅuṅu, ka ha we kpasuem iwe. 19 Ọ̀ bu Mu ka ndi ahu nākpasu iwe? (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); ọ̀ bughi ha onwe-ha ka ha nākpasu iwe, ka ihere we me ha n'iru? 20 N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, iwem na ọnumam ka anāwusi n'ebe a, n'aru madu, na n'aru anu-ulo, na n'aru osisi ọhia, na n'aru nkpuru nke ala-ubi; ọ gēre kwa ọku, agaghi-emenyu kwa ya. 21 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Tukwasinu àjà-nsure-ọku nile unu n'elu àjà nile unu, ri-kwa-nu anu. 22 N'ihi na agwaghm nna-unu-hà okwu, enyeghkwam ha iwu n'ubọchi M'mere ka ha si n'ala Ijipt puta, bayere ihe nile nke àjà-nsure-ọku na nke àjà ọzọ: 23 kama ọ bu okwu a ka M'nyere ha n'iwu, si, Genu nti olum, M'gābu-kwa-ra unu Chineke, unu onwe-unu gābu-kwa-ram otù ndi: je-kwa-nu ije n'uzọ nile nke M'nēnye unu n'iwu, ka o we diri unu nma. 24 Ma ha egeghi nti, ha atọghi kwa nti-ha-n'ala, ha we jegharia na ndum-ọdu nile na n'isi-ike nke obi ọjọ ha, ha we daghachi azu, ghara iga n'iru. 25 Site n'ubọchi ahu nke nna-unu-hà ji si n'ala Ijipt puta rue ta ka M'nēzitere unu ndi-orùm nile, bú ndi-amuma, nēbili n'isi-ututu nēzite ha kwa-ubọchi: 26 ma ha egeghm nti, ha atọghi kwa nti-ha n'ala, ha we kwesie olu-ha ike: ha mere ihe ọjọ kari ndi bu nna-ha. 27 I gāgwa kwa ha okwu ndia nile; ma ha agaghi-ege gi nti: i gākpọ kwa ha òkù; ma ha agaghi-aza gi. 28 I gāsi kwa ha, Nka bu mba ahu nke nēgeghi nti olu Jehova, bú Chineke-ha, nke nānaraghi kwa idọ-aka-na-nti: ikwesi-ntukwasi-obi alawo n'iyì, ebipuwo kwa ya n'ọnu-ha. 29 Kọpu isi-gi, Jerusalem, tufue ya, buli kwa abù-ákwá n'elu ebe nile di elu nke ọhia nādighi; n'ihi na Jehova ajuwo, rapu kwa ọb͕ọ nke nrubiga-ókè nke iwe-Ya. 30 N'ihi na umu Juda emewo ihe jọrọ njọ n'anyam; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: ha edowo ihe-árú nile ha n'ulo ahu nke akpọkwasiri aham, imeru ya. 31 Ha ewuwo kwa ebe nile di elu nke Tofet, nke di na ndagwurugwu nwa Hinom, isure umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom n'ọku; bú ihe nke M'nēnyeghi n'iwu, ọ bataghi kwa n'obim. 32 N'ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e agaghi-akpọ kwa ya Tofet ọzọ, ma-ọbu Ndagwurugwu nwa Hinom, kama agākpọ ya Ndagwurugwu Ob͕ub͕u: ha gēlì kwa ozu na Tofet n'ihi na ebe ilì ozu adighi. 33 Ozu ndi nka gāghọ-kwa-ra anu-ufe nke elu-igwe, ghọ-kwa-ra anumanu nke uwa, ihe-oriri; ọ dighi kwa onye nāruli ha. 34 M'gēme kwa ka olu nke obi-utọ na olu ọṅù na olu nke nwoke nālu nwunye ọhu na olu nke nwanyi anālu ọhu kwusi n'obodo nile nke Juda, na n'èzí nile nke Jerusalem: n'ihi na nkpọnkpọ ebe ka ala nka gāghọ.

Jeremaia 8

1 Na mb͕e ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ha gēkpoputa ọkpukpu ndi-eze Juda, na ọkpukpu ndi-isi-ya, na ọkpukpu ndi-nchu-àjà, na ọkpukpu ndi-amuma, na ọkpukpu ndi bi na Jerusalem, n'íhì-ha: 2 ha gāb͕asa ha n'anyanwu, na n'ọnwa, na n'usu nile nke ihe elu-igwe, nke ha huworo n'anya, nke ha fèwo-kwa-ra, nke ha jesowo-kwa-ra, nke ha chọwo-kwa-ra, nke ha kpọwo-kwa-ra isi ala nye: agaghi-achikọta ha, agaghi-elì kwa ha; ǹsí-anu nke di n'iru ala ka ha gāghọ. 3 Ha gārọputa kwa ọnwu kari ndu, bú ndi nile fọduru, ndi fọduru site n'ab͕uru ọjọ a, ndi fọduru n'ebe nile M'chusaworo ha, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke ndi-agha puta. 4 I gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova siri, Ha ga-ada, ghara ibili ọzọ? madu, ọ̀ gādaghachi azu, ghara ilata? 5 Gini mere ndi nka nke Jerusalem ji adaghachi azu na ndaghachi-azu ebighi-ebi? ha ejidesiwo aghughọ ike, ha ajuwo ilọta. 6 Aṅaram nti we nu, ihe nēzighi ezi ka ha nēkwu: ọ dighi onye ọ bula chèghariworo uche n'ihe ọjọ ya, si, Gini ka m'meworo? onye ọ bula echighariwo ba n'ọb͕ub͕a-ọsọ-ya, dika inyinya nke nāb͕abiga ọsọ ókè n'agha. 7 Ọbuná ub͕ala n'elu-igwe mara mb͕e-ya nile akara àkà; ọzọ, nduru na eleke na okwoli nāriba mb͕e ọbibia-ha ama; ma ndim amaghi ikpé Jehova. 8 Ùnu si aṅa si, Ndi mara ihe ka ayi bu, iwu Jehova di kwa n'aka ayi? Ma otú o di, le, okwu-ugha ka pen ugha nke ndi-ode-akwukwọ meworo ya. 9 Ihere emewo ndi mara ihe, ha atuwo ujọ, ewe jide ha: le, okwu Jehova ka ha juworo; ọ̀ bu kwa aha amam-ihe gini ka ha nwere? 10 N'ihi nka ka M'gāchiri nwunye-ha nye ndi ọzọ, were kwa ubi nile ha nye ndi gēnweta ha: n'ihi na site n'onye dikarisiri ntà we rue onye dikarisiri uku onye ọ bula bu onye akpiri urù nēzighi ezi nākpọ nku, site n'onye-amuma we rue onye-nchu-àjà onye ọ bula nēme ihe n'ugha. 11 Ha we gwọ nb͕aji ukwu na aka nke ada ndim nākpọghi ya ihe, si, Udo, udo; mb͕e udo nādighi. 12 ọ̀ di ihere mere ha megbe ha mere ihe-árú? é-è, ihere adighi-eme ha ma-ọli, ọ dighi kwa itiye-n'ọnọdu-ihere ha mara: n'ihi nka ha gāda n'etiti ndi nāda ada: na mb͕e eletara ha ha gāsu ngọngọ, ka Jehova siri. 13 M'gēkpochapusi ha; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: nkpuru-vine adighi n'osisi vine, ọ dighi fig di n'osisi fig, akwukwọ akpọnwuwo kwa; M'we doro ha ndi nāgabiga ha n'isi. 14 N'ìhi gini ka ayi onwe-ayi nānọdu ala? chikọtanu onwe-unu, ka ayi ba n'obodo nile ewusiri ike, we debe ọnu-ayi du n'ebe ahu: n'ihi na Jehova, bù Chineke-ayi, emewo ka ayi debe ọnu-ayi du, O mewo kwa ka ayi ṅua miri ńsí, n'ihi na ayi emehiewo megide Jehova. 15 Ayi lere anya udo, ma ọ dighi ezi ihe biara; ayi lere anya mb͕e ọgwugwọ, ma le, oké egwu. 16 Site na Dan ka anuru ima-imi nke inyinya-ya nile: site n'olu ọbube nile nke inyinya-ya nile di ike ala nka nile amawo jijiji; ha we bia richapu ala na ùjú-ya; obodo na ndi bi nime ya. 17 N'ihi na, le, M'ganēzite agwọ, bú ubí, n'etiti unu, nke ọ nādighi urà agārà ha; ha gāta kwa unu aru; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 18 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na agamab͕asa irum megide unu taa! n'arum ka aru nādighi obim ike. 19 Le, ọ bu olu ntiku nke ada ndim site n'ala di anya nke-uku: Jehova, Ọ̀ nọghi na Zaion? Eze-ya, Ọ̀ nọghi nime ya? Gini mere ha ji were arusi nile ha apiri api, were kwa ihe-efu nile nke onye ala ọzọ, kpasuem iwe? 20 Owuwe-ihe-ubi agabigawo, nghọkọta-nkpuru agwusiwo, ma ayi onwe-ayi, azọputaghi ayi. 21 N'ihi nb͕aji ukwu na aka nke ada ndim ka ab͕ajiworom ukwu na aka: anameyi uwe-nkpe; iju-anya ejidesiwo m ike. 22 Ọ̀ dighi balm di na Gilead? ọ̀ dighi dibia nọ n'ebe ahu? ọ̀ bu kwa gini mere anu-aru ọhu nējighi epuchi n'aru ada ndim?

Jeremaia 9

1 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na isim bu miri miri, asi anyam abua bu isi-iyi nke anya-miri, ka m'we kwa ákwá n'ehihie na abali bayere ndi eb͕uru eb͕u nke ada ndim! 2 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na m'nwere ebe inọ ọnọdu-abali nke ndi-ije n'ọzara; ka m'we rapu ndim, si n'ebe ha nọ la! n'ihi na ha nile bu ndi nākwa iko, nzukọ ndi-nghọb͕u. 3 Ha we kwe ire-ha, dika uta-ha, ib͕a okwu-ugha dika àkú; ma ọ bughi n'ebe ikwesi-ntukwasi-obi di ka ha diworo ike n'ala: n'ihi na ha esiwo n'ihe ọjọ pukuru ihe ọjọ, ma Mu ka ha nāmaghi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 4 Lezienu anya, onye ọ bula onye-ab͕ata-obi-ya, unu atukwasi-kwa-la nwa-nne ọ bula obi: n'ihi na nwa-nne ọ bula nējidesi ikiri-ukwu nwa-nne-ya ike, ọzọ, onye-ab͕ata-obi ọ bula nējeghari nāb͕a àmà ọjọ. 5 Ha nākwa kwa emò, onye ọ bula onye-ab͕ata-obi-ya, ma ezi-okwu ka ha nādighi-ekwu: ha ezíwo ire-ha ikwu okwu-ugha; ọ bu n'ime ajọ omume ka ike gwuru ha. 6 Ebe-obibi-gi di n'etiti aghughọ; n'aghughọ ka ha juru imaram; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 7 N'ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha ji kwue otú a, si, Le, M'gaje inucha ha, we nwaputa ha; n'ihi na M'gēsi aṅa me n'ihi ada ndim? 8 Àkú nke nēb͕u eb͕u ka ire-ha bu; okwu aghughọ ka o kwuworo: n'ọnu-ya ka madu nāgwa onye-ab͕ata-obi-ya okwu udo, ma n'obi-ya ọ nēche ya anwu. 9 M'gaghi-eleta ha n'ihi ihe ndia? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: nkpuru-obim, ọ̀ gaghi-abọ̀ mba nke di otú a ọ́bọ̀? 10 Ugwu nile ayi ka m'gēbuliri ikwa-ákwá na igo-ákwá, buli-kwa-ra ebe-ita-nri nile nke ọzara abù-ákwá, n'ihi na esuresiwo ha ọku, ọ we ghara idi onye ọ bula nāgabiga; anughi kwa olu anu-ulo; ma anu-ufe nke elu-igwe ma anumanu ab͕alagawo, ha alawo. 11 M'gēme kwa Jerusalem ka ọ ghọ obo-ihe obo-ihe, ebe-obibi nke nkita-ọhia; ọzọ, obodo nile nke Juda ka M'gēme ka ha ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, onye-obibi we ghara idi. 12 Ònye bu onye mara ihe, ka o we ghọta nka ònye bu kwa onye ahu ọnu Jehova gwaworo okwu, ka o we gosi ya? n'ìhi gini ka ala nka laworo n'iyì, esure kwa ya ọku dika ọzara, onye-ngabiga we ghara idi? 13 Jehova we si, N'ihi na ha arapuwo iwum nke M'tiyere n'iru ha, na n'ihi na ha egeghi nti olum, ghara kwa ijeghari nime ya; 14 ma ha ejesowo isi-ike nke obi-ha, jeso kwa Bealim, nke ndi bu nna-ha zíri ha: 15 n'ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, ji si otú a, Le, M'gaje ime ka ha, bú ndi nka, rie wormwood, M'gēme kwa ka ha ṅua miri ńsí. 16 M'gāchusa kwa ha n'etiti mba nile, ndi ha nāmaghi, ma ha onwe-ha ma ndi bu nna-ha: M'gēziso ha mma-agha, rue mb͕e M'mere ka ha gwusia. 17 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Tugharinu uche, kpọ-kwa-nu ndinyom nābù abù-ákwá, ka ha we bia; ziga-kwa-nu ikpọ ndinyom mara ihe, ka ha we bia: 18 ka ha me kwa ngwa, buliere ayi igo-ákwá, ka anya-miri we si n'anya-ayi rùda, ka miri we si kwa na mbubere-anya-ayi rùputa. 19 N'ihi na olu nke igo-ákwá ka anuworo site na Zaion, Le ka esi bibisia ayi nke-uku! ihere emewo ayi nke-uku, n'ihi na ayi arapuwo ala-ayi, n'ihi na ha atudawo ebe-obibi nile ayi. 20 Ma nurunu okwu Jehova, unu ndinyom, ka nti-unu nara kwa okwu ọnu-Ya, zí-kwa-nu umu-unu ndinyom igo-ákwá, ka nwayi ọ bula zí kwa nwayi-ibe-ya abù-ákwá. 21 N'ihi na ọnwu arigobatawo na window nile nke ayi, ọ batawo n'ulo-elu nile nke ayi; ibipu umu-ntakiri n'èzí, na umu-okorọbia n'amá nile. 22 Kwue, si, Otú a ka ihe nke si n'ọnu Jehova puta siri, Ozu madu gāda dika ǹsí-anu n'ọhia, na dika nju-aka ọka n'azu onye nēwe ihe-ubi, ọ dighi kwa onye nāchikọta ha. 23 Otú a ka Jehova siri, Ka onye nke mara ihe ghara inya isi n'amam-ihe-ya, ka dike ghara inya isi n'idi-ike-ya, ka ọgaranya ghara inya isi n'àkù-ya: 24 kama, onye nānya isi, ya nya isi na nka, na o nwere uche n'ebe M'nọ, we maram, na Mu onwem bu Jehova Nke nēme ebere na ikpé ziri ezi na ezi omume n'uwa: n'ihi na ihe ndia atọwom utọ; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 25 Le, ubọchi nābia, (ọbu ihe si N'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gewere nmehie-ha leta ndi nile bìri úgwù n'ebìghi-úgwù-ha; 26 bú Ijipt, na Juda, na Edom, na umu Amon, na Moab, na ndi nile akọpuworo usọ isi-ha, ndi bi n'ọzara: n'ihi na mba nile bu ndi anēbighi úgwù, ulo Israel nile bu kwa ndi anēbighi úgwù n'obi.

Jeremaia 10

1 Nurunu okwu Jehova gwaworo unu, unu ulo Israel: 2 Otú a ka Jehova siri, Unu amutala uzọ mba nile, unu atu-kwa-la ujọ ihe-iriba-ama di iche iche nke elu-igwe; n'ihi na mba nile nātu ujọ ha. 3 N'ihi na ukpuru nile nke ndi nile di iche iche bu ihe-efu: n'ihi na ọ bu nání osisi, nke madu b͕utuworo, ọlu aka abua nke onye-ọ̀kà ji anyu-ike alu ọlu. 4 Ha ji ọla-ọcha, ji kwa ọla-edo, eme ya ka ọ ma nma; ha ji ǹtú, ji kwa otùtù, eme ya ka o sie ike, ka ọ we ghara isu ngọngọ. 5 Ha di ka nkwu, ihe akpuru akpu ka ha bu, ha adighi-ekwu okwu: aghaghi ibu ha ebu, n'ihi na ha adighi-azọ ije. Unu atula egwu ha; n'ihi na ha agaghi-eme ihe ọjọ, ọzọ kwa, ime izi ihe adighi ha n'aka. 6 Ọ dighi nke di ka Gi ma-ọli, Jehova; Onye uku ka I bu, ihe di uku ka aha-Gi di kwa n'idi-ike. 7 Ònye nāgaghi-atu egwu Gi, Eze mba nile? n'ihi na Gi ka o kwesiri: n'ihi na n'etiti ndi-amam-ihe nile nke mba nile, na n'ala-eze nile ha, ọ dighi onye di ka Gi ma-ọli. 8 Ma ha nile n'otù bu anu-ọhia na ndi-nzuzu: idọ-aka-na-nti nke ihe-efu, nání osisi ka ọ bu. 9 Ọla-ọcha di nke etisaworo mbadamba nke anēsi na Tashish weta, na ọla-edo nke sitere n'Ufaz, bú ọlu onye-ọ̀kà na nke aka onye-nnucha-ọla: ákwà anunu na ákwà ododo bu uwe-oyiyi-ha; ọlu nke ndi mara ihe ka ha nile bu. 10 Ma Jehova bu Chineke n'ezi-okwu; Ya onwe-ya bu Chineke di ndu, na eze nādi mb͕e ebighi-ebi: n'iwe-Ya uwa nāma jijiji, mba nile apughi kwa inagide iwe-Ya di ọku. 11 Otú a ka unu gāsi ha, Chi nile nke nēmeghi elu-igwe na uwa, ha gāla n'iyì pua n'uwa na n'okpuru elu-igwe, bú chi ndia. 12 Onye jiworo ike-Ya me uwa, Onye jiworo amam-ihe-Ya me ka elu-uwa dum madu bi guzosie ike, Onye jiworo nghọta-Ya setipu elu-igwe: 13 mb͕e Ọ nēme ka olu-Ya da, ùzù miri di n'elu-igwe, O mee ka alulu si na nsọtu uwa kwugo; O meworo miri-ozuzo àmùmà, Ọ nēme kwa ka ifufe si n'ulo-nkwakọba-Ya nile puta. 14 Nání anu-ọhia ka madu ọ bula ghọworo site n'ihe-ọmuma-ya; emewo ka ihere me onye-nnucha-ọla ọ bula site n'arusi-ya apiri api: n'ihi na okwu-ugha ka arusi-ya awuru awu bu, nku-ume adighi kwa nime ha. 15 Ihe-efu ka ha bu, ọlu ikwa-emò: na mb͕e nleta-ha ha gāla n'iyì. 16 Ọ bughi dika ihe ndia ka Òkè Jekob bu; n'ihi na onye nākpu ihe nile ka Ọ bu; Israel bu kwa ebo nke ihe-nketa-Ya: Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya. 17 Chikọputa ihe-agha-gi n'ala, gi onye bi n'obodo anānọchigide n'agha. 18 N'ihi na otú a ka jehova siri, Le, M'gaje imapu ndi bi n'ala nka dika èbè na mb͕e a, M'gākpab͕u kwa ha, ka ha we chọputa ha. 19 Ahuhu dirim bayere nb͕aji ukwu na akam! ọnyám nke etiputa jọrọ njọ: ma mu onwem siri, N'ezie nka bu ọriam, m'gēburu kwa ya. 20 Emebisiwo ulo-ikwūm, etibìsiwo kwa udọ̀m nile: umum esiwo n'ebe m'nọ pua, ha anọghi kwa: ọ dighi kwa onye nēseti ulo-ikwūm nākwuli kwa ákwà-nkwubam. 21 N'ihi na ndi-ọzùzù-aturu aghọwo anu-ọhia, ma Jehova ka ha nājughi ase: n'ihi nka ha enweghi uche, aturu nile ha nāzù we b͕asa. 22 Ge nti olu nke ihe anuru, le, ọ nābia, oké ùzù agha nēsi kwa n'ala Ugwu bia, ime ka obodo nile nke Juda ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ebe-obibi nke nkita-ọhia. 23 Jehova, amawom na ọ bughi n'aka ya onwe-ya ka uzọ madu di: ọ bughi onye ọ bula nke nēje ije nwe ime ka nzọ-ukwu-ya guzosie ike. 24 Dọm aka na nti, Jehova, ma nání n'ikpé; adọlam aka na nti n'iwe-gi, ka I we ghara ibilatam. 25 Wukwasi mba nile ọzọ ọnuma-Gi, bú ndi nāmaghi Gi, wukwasi kwa ab͕uru nile ndi nākpọkughi aha-Gi: n'ihi na ha eripiawo Jekob, e, ha eripiawo ya, me ka ọ gwusia, ha emewo kwa ka ebe-obibi-ya tọb͕ọrọ n'efu.

Jeremaia 11

1 Okwu nke ruru Jeremaia nti site n'aka Jehova, si, 2 Nurunu okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu a, gwa ndi Juda, gwa kwa ndi bi na Jerusalem, okwu; 3 i gāsi kwa ha, Otúaka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri: Onye anābu ọnu ka onye ahu bu nke nādighi-anu okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu a, 4 nke M'nyere nna-unu-hà n'iwu n'ubọchi M'mere ka ha si n'ala Ijipt, si n'oké ọku ígwè ahu, puta, si, Genu nti olum, me ha, dika ihe nile si di nke M'nēnye unu n'iwu: unu ewe burum otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra unu Chineke: 5 ka M'we me ka iyi ahu guzosie ike, bú nke M'ṅuru nna-unu-hà, inye ha ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù na ya, dika o si di ta. M'we za, si, Amen, Jehova. 6 Jehova we sim, Kpọsa okwu ndia nile n'obodo nile nke Juda, na n'èzí nile nke Jerusalem, si, Nurunu okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu a, me kwa ha. 7 N'ihi na ab͕aworom nna-unu-ha àmà nke-uku n'ubọchi M'mere ka ha si n'ala Ijipt rigoputa, rue ta, nēbili n'isi-ututu nāb͕a àmà, si, Genu nti olum. 8 Ma ha egeghi nti, ha atọghi kwa nti-ha n'ala, ha we jegharia, onye ọ bula n'isi-ike nke obi ọjọ ha: M'we me ka okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu a biakwasi ha, bú nke M'nyere n'iwu ka ha me, ma ha emeghi ha. 9 Jehova we sim, Achọputawo nkekọta imegidem n'etiti ndi Juda, na n'etiti ndi bi na Jerusalem. 10 Ha alaghachikuruwo ajọ omume nile nke ndi bu nna-ochie-ha, ndi juru inu okwum nile; ha onwe-ha ejesowo kwa chi ọzọ di iche iche ifè ha òfùfè: ulo Israel na ulo Juda emebiwo ọb͕ub͕a-ndum nke Mu na ndi bu nna-ha b͕ara. 11 N'ihi nka ka Jehova ji si otú a, Le, M'gaje ime ka ihe ọjọ, nke ha nāpughi isi nime ya puta, biakute ha; ha gētikukwam, ma M'gaghi-ege ha nti. 12 Obodo nile nke Juda na ndi bi na Jerusalem gēje kwa tikuru chi nile nke ha onwe-ha nēsurere ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ: ma ọ dighi nzọputa ma-ọli ha gāzọputa ha na mb͕e ihe ọjọ ha. 13 N'ihi na ka ọnu-ọgugu obodo-gi ra, otú a ka chi-gi nile di, gi Juda; ka ọnu-ọgugu èzí Jerusalem ra kwa, otú a ka unu doworo ebe-ichu-àjà nye ihe-ihere ahu, bú ebe-ichu-àjà isurere Beal ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ. 14 Ma gi onwe-gi, ekpela ekpere bayere ndi nka, ebuli-kwa-la iti-nkpu na ikpe-ekpere bayere ha: n'ihi na M'gaghi-nānu olu-ha na mb͕e ha nākpokum n'ihi ihe ọjọ ha. 15 Gini ka nwayi nke ihe-ya nātọm utọ nke-uku nwere n'ulom, ebe ya na ọtutu madu meworo ajọ ihe-nzube, ọzọ, anu nsọ nēsi kwa n'aru gi gabiga? mb͕e i nēme ihe ọjọ, mb͕e ahu ka i nāṅuri ọṅu. 16 Osisi olive di ndu, nke mara nma n'imì nkpuru ọma, otú a ka Jehova kpọrọ aha-gi: n'olu nkpọtu uku ka O suyeworo ya ọku, alaka-ya nile anyakasiwo kwa. 17 N'ihi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Onye ahu nke kuworo gi n'ala, ekwuwo ihe ọjọ megide gi, n'ihi ihe ọjọ nke ulo Israel na ulo Juda, nke ha meworo onwe-ha n'ikpasum iwe n'isurere Beal ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ. 18 Jehova me-kwa-ram ka m'mara ya, m'we mara ya: mb͕e ahu ka I mere ka m'hu omume nile ha. 19 Ma mu onwem di ka nwa-aturu azùbiri azùbi nke anākpuru ije n'ob͕ub͕u-ya; ma amaghm na ọ bu mu ka ha zubereri nzube megide, si, Ka ayi bibie osisi na ihe-oriri-ya, ka ayi bipu kwa ya n'ala ndi di ndu, ka ewe ghara icheta kwa aha-ya ọzọ. 20 Ma, Gi Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Onye nēkpe ikpe n'ezi omume, Onye nānwa akuru na obi, kwe ka m'hu ọ́bọ̀-Gi nke I gābọ̀ ha: n'ihi na Gi ka m'kpugheworo okwu-ikpem. 21 N'ihi nka ka Jehova ji kwue okwu di otú a bayere ndi Anatot, bú ndi nāchọ ndu-gi, si, I gaghi-ebu amuma n'aha Jehova, ka i we ghara inwu site n'aka-ayi: 22 n'ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha ji si otú a, Le, M'gaje iwere nmehie-ha leta ha: umu-okorọbia-ha gānwu site na mma-agha; umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom gānwu site n'oké unwu; 23 ọ dighi kwa ndi fọduru ha gēnwe: n'ihi na M'gēme ka ihe ọjọ biakute ndi Anatot, n'arọ nleta-ha.

Jeremaia 12

1 Onye ezi omume ka I bu, Jehova, mb͕e mu na Gi nēkperita ikpe: ma otú ọ di, okwu ikpem nile ka m'gēkwu n'ebe I nọ: gini mere uzọ ndi nēmebi iwu ji agara ha nke-ọma? gini mere ndi nile nāghọb͕u nke-uku ji anọ n'udo? 2 I kuwo ha dika osisi, e, ha ab͕awo nkpọrọgwu; ha nētó, e, ha amiwo nkpuru: nso ka I nọ n'ọnu-ha, ma I nọ akuru-ha n'ebe di anya. 3 Ma Gi onwe-gi maram, Jehova; I nāhum, nwa kwa nkpuru-obim n'ebe I nọ: dọkpupu ha dika ìgwè ewu na aturu agēb͕u eb͕u, do ha nsọ nye ubọchi ob͕ub͕u. 4 Rùe ole mb͕e ka ala gēru újú? rùe ole mb͕e ka ihe-ọkukú nke ubi nile gākpọnwu? site n'ihe ọjọ nke ndi bi nime ya ekpochapuwo anu-ulo nile na anu-ufe; n'ihi na ha siri, Ọ gaghi-ahu ikpe-azu-ayi. 5 Asi na i so ndi ji ukwu eje b͕a ọsọ, ha we me ka ike gwu gi, ì gēsi kwa aṅa nu ọku n'obi ib͕akari inyinya? ọ bu kwa n'ala udo ka i nọ na ntukwasi-obi, ma ì gēsi aṅa me na nbili-elu nke Jọdan? 6 N'ihi na ọbuná umu-nne-gi, na ulo nna-gi, ọbuná ha onwe-ha aghọb͕uwo gi; ọbuná ha onwe-ha akpọzuwo nkpu n'azu gi: ekwela ha, mb͕e ha gāgwa gi ezi ihe. 7 Arapuwom ulom, ajuwom ihe-nketam; ewerewom nwayi nke ihe-ya nātọ nkpuru-obim utọ nke-uku nye n'ọbu-aka ndi-iro-ya. 8 Ihe-nketam aghọworom ihe dika ọdum n'oké ọhia: o mewo ka olu-ya da megidem; n'ihi nka ka M'kpọworo ya asì. 9 Ọ̀ bu udele turu agwa ka ihe-nketam dirim? udele, hà nọ ya buruburu nēmegide ya? jenu, chikọta anu ọhia nile, me ka ha bia iri ihe. 10 Ọtutu ndi-ọzùzù-aturu ebibiwo ubi-vine nkem, ha azọdawo òkèm, ha emewo òkèm anāchọsi ike ka ọ ghọ ọzara tọb͕ọrọ n'efu. 11 O mewo ya ka ọ ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu; o nēru újú n'ebe m'nọ, ebe ọ tọb͕ọrọ n'efu; ebe tọb͕ọrọ n'efu ka ala nka nile bu, n'ihi na ọ dighi onye ọ bula nētiye ya n'obi. 12 N'elu ebe nile di elu nke ọhia nādighi nke di n'ọzara ka ndi nāpunara madu ihe biaworo: n'ihi na mma-agha Jehova nwere nēripia site n'otù nsọtu nke ala we rue nsọtu ọzọ nke ala: ọ dighi udo anu-aru ọ bula, bú madu, nwere. 13 Ha aghawo ọka wheat, ma ogwu bu ihe-ubi ha wereworo; ha aghọwo ndi-ọria, ma ọ dighi-abara ha urù: ka ihere ihe-omume nile unu me kwa unu, sita n'iwe di ọku nke Jehova. 14 Otú a ka Jehova kwuru megide ndi-ab͕ata-obi ọjọm nile, ndi nēmetu ihe-nketa ahu aka nke M'meworo ka ndim, bú Israel, keta: le, M'gaje iropu ha n'elu ala-ha, ulo Juda ka M'gēropu kwa n'etiti ha. 15 O gēru kwa, mb͕e M'ropusiri ha, na M'gēnwe kwa obi-ebere n'aru ha ọzọ; M'gēme kwa ka ha lata, onye ọ bula n'ihe-nketa-ya, na onye ọ bula n'ala-ya. 16 Ọ gēru kwa, ọ buru na ha amuta uzọ nile nke ndim nke-ọma, iji aham ṅu iyi, si, Jehova nādi ndu; dika ha zíri ndim iji Beal ṅu iyi; agēwuli kwa ha dika ulo n'etiti ndim. 17 Ma ọ buru na ha anughi, M'gēropu kwa mba ahu, nēropu ya nēme kwa ka ọ la n'iyì; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

Jeremaia 13

1 Otú a ka Jehova sirim, Je, zutara onwe-gi ihe-ọkiké nke flax, tukwasi ya n'úkwù-gi, ma emela ka ọ ba na miri. 2 M'we zuta ihe-ọkiké dika okwu Jehova si di, m'we tukwasi ya n'úkwù. 3 Okwu Jehova we ruem nti nke ub͕ò abua, si, 4 Were ihe-ọkiké ahu nke i zutaworo, nke di n'úkwù-gi, bilie, je Yufretis, zobe ya n'ebe ahu nime nb͕awa nke nkume di elu. 5 M'we je, zobe ya n'akuku Yufretis, dika Jehova nyerem iwu. 6 O rue, mb͕e ọtutu ubọchi gasiri, na Jehova sirim, Bilie, je Yufretis, weputa ihe-ọkiké ahu n'ebe ahu, bú nke M'nyere gi iwu izobe n'ebe ahu. 7 M'we je Yufretis, gwue, weputa ihe-ọkiké ahu n'ebe m'zobere ya-ri: ma, le, ihe-ọkiké ahu ebibiwo, ọ bàghi n'ihe ọ bula. 8 Okwu Jehova we ruem nti, si, 9 Otú a ka Jehova siri, Otú a ka M'gēbibi npako Juda na npako bara uba nke Jerusalem. 10 Ndi ọjọ nka ndi nāju inu okwum nile, ndi nējeghari n'isi-ike nke obi-ha, we jeso chi di iche iche ọzọ ifè ha, na ikpọ isi ala nye ha, ndi nka gādi kwa ka ihe-ọkiké a, nke nādighi-abà n'ihe ọ bula. 11 N'ihi na dika ihe-ọkiké nārapara n'úkwù madu, otú a ka M'meworo ka ulo Israel nile na ulo Juda nile rapara n'arum, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); ka ha we ghọrọm otù ndi, na aha, na otuto, na ima-nma: ma ha anughi. 12 I gāgwa kwa ha okwu a, si, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, Agāb͕aju ite ọ bula manya-vine: ha gāsi kwa gi, Ọ̀ bu na ayi amaghi na agāb͕aju ite ọ bula manya-vine? 13 I gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova siri, Le, M'gaje iwere nṅubiga-manya-ókè mejue ndi nile bi n'ala nka, bú ndi-eze ndi nānọchi Devid n'oche-eze-ya, na ndi-nchu-àjà, na ndi-amuma, na ndi nile bi na Jerusalem. 14 M'gātupia kwa ha, otù onye n'elu ibe-ya, ọbuná ndi bu nna na umu-ha n'otù; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: M'gaghi-enwe ọmiko, M'gaghi-eme kwa ebere, M'gaghi-enwe kwa obi-ebere, ka M'we ghara ibibi ha. 15 Nurunu, ge kwa nti; unu adila elu n'obi: n'ihi na Jehova ekwuwo. 16 Nyenu Jehova, bú Chineke-unu, nsọpuru, tutu O me ka ọchichiri b͕a, na tutu ukwu-unu akpọbì ukwu n'elu ugwu chi-ojiji; unu we le anya ìhè, ma O mewo ya ka ọ ghọ onyinyo ọnwu, O mewo kwa ka ọ b͕a oké ọchichiri. 17 Ma ọ buru na unu anughi ya, na nzuzo ka nkpuru-obim gākwa ákwá n'ihi npako-unu; anya-miri gāpu kwa n'anyam nke-uku, anya-miri ewe si n'anyam rùda, n'ihi na adọtara ìgwè aturu Jehova n'agha. 18 Si eze, si kwa eze-nwayi, Menu onwe-unu ka unu di ala, nọdunu ala: n'ihi na ihe-isi nile nke unu adapuwo, bú okpu-eze nke ima-nma-unu. 19 Emechiwo obodo nile nke Negeb, ọ dighi kwa onye nēmeghe ha: emewo ka Juda je biri n'ala ọzọ, ha nile emezuwo ka ọ je biri n'ala ọzọ. 20 Welie anya-unu, hu ndi nēsi n'Ugwu bia: òle ebe ìgwè aturu enyere gi, bú ìgwè ewu na aturu-gi mara nma? 21 Gini ka i gāsi, mb͕e Ọ gēwere nmehie-gi leta gi, ebe gi onwe-gi zíworo ndi ahu imegide gi, bú ezi ndi-eyì-gi, ka ha buru ndi-isi-gi? ihe-nb͕u di iche iche, hà agaghi-ejidesi gi ike, dika nwanyi ime nēme? 22 Ma mb͕e i gāsi n'obi-gi, Gini mere ihe ndia ji dakwasim? n'ihi iba-uba nke ajọ omume-gi ka eji kpughe ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-gi, me ikiri-ukwu-gi abua ihe-ike. 23 Onye Etiopia, ọ̀ gāb͕anwe akpukpọ-aru-ya? ma-ọbu agu, ọ̀ gāb͕anwe agwa-ya? ọ buru otú a unu onwe-unu puru kwa ime ezi ihe, bú ndi emere ka unu muta ime ihe ọjọ. 24 M'gāchusa kwa ha, dika ahihia-ọka kpọrọ nku nke nāgabiga, nye ifufe ọzara. 25 Nka bu ihe efetara gi na nzà, òkè nke atùworo nye gi site nam, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); n'ihi na i chezọwo Mu onwem, we tukwasi okwu-ugha obi-gi. 26 Ya mere Mu onwem ji kpughe kwa ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-gi rue iru-gi, ewe hu nlelì-gi. 27 Ikwa-iko-gi nile, na ọbube-gi nile dika inyinya, nzube ọjọ nke ikwa-iko-gi, n'elu ugwu ntà nile n'ọhia, ahuwom ihe-árú-gi nile ndia. Ahuhu diri gi, Jerusalem! i gaghi-adi ọcha; #mb͕e ole gāgabiga tutu ọ di?

Jeremaia 14

1 Okwu Jehova nke ruru Jeremaia nti bayere okwu nb͕ochi miri-ozuzo. 2 Juda eruwo újú, ọnu-uzọ-ama-ya nile atalatawo kwa, ha yiri uwe-nkpe nọdu n'ala; iti-nkpu Jerusalem arigowo. 3 Ndi-ebube-ha ezigawo ndi-ntà-ha ichuta miri: ha abiaruwo olùlù-miri nile, ha achọtaghi miri; ha alatawo n'ite efu: ihere emewo ha, etiyewokwa ha n'ọnọdu-ihere, ha ekpuchiwo kwa isi-ha. 4 N'ihi ala nke b͕awara ab͕awa, n'ihi na oké miri-ozuzo adighi n'ala, ihere emewo ndi-ọlu-ubi, ha ekpuchiwo isi-ha. 5 N'ihi na ọbuná nne-ele amuwo nwa n'ọhia, we rapu ya, n'ihi na ahihia ndu adighi. 6 Inyinya-ibu-ọhia eguzowo kwa n'elu ebe nile di elu nke ọhia nādighi, ha ekubawo ifufe dika nkita-ọhia; anya-ha adalawo n'isi, n'ihi na ihe-ọkukú adighi. 7 Ọ bu ezie na ajọ omume-ayi azawo megide ayi, ma Gi lua olu n'ihi aha-Gi, Jehova: n'ihi na ndaghachi-azu-ayi di ọtutu; Gi ka ayi mehieworo megide. 8 Gi olile-anya Israel, onye-nzọputa-ya na mb͕e ahuhu, n'ìhi gini ka I di ka ọbìa n'ala nka, na dika onye-ije nke setiworo ulo-ikwū-ya inọ ọnọdu-abali? 9 N'ìhi gini ka I di ka onye ihe b͕agwojuworo anya, dika dike nāpughi izọputa? ma Gi onwe-gi nọ n'etiti ayi, Jehova, ọ bu kwa aha-Gi ka akpọkwasiworo ayi; arapula ayi. 10 Otú a ka Jehova siri ndi nka, Ọbuná otú a ka ha huworo nwaghari n'anya; ha eb͕ochighi ukwu-ha: ihe-ha atọghi kwa Jehova utọ; ub͕u a ka Ọ nēcheta ajọ omume-ha, were nmehie-ha leta ha. 11 Jehova we sim, Ekpela ekpere bayere ndi nka ichọ ọdi-nma-ha. 12 M'gbe ha nēbu ọnu, M'gaghi-nānu iti-nkpu-ha; ọzọ, mb͕e ha nēsure àjà-nsure-ọku na onyinye-inata-iru-ọma, ihe-ha agaghi-nātọm utọ: kama mma-agha na oké unwu n'ajọ oria na-efe efe ka M'gaje iji me ka ha gwusia. 13 M'we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! le, ndi-amuma nāsi ha, Unu agaghi-ahu mma-agha, unu agaghi-enwe kwa oké unwu; kama udo nke ezi-okwu ka M'gēnye unu n'ebe a. 14 Jehova we sim, Amuma ugha ka ndi-amuma nēbu n'aham: eziteghm ha, enyekwaghm ha iwu, agwakwaghm ha okwu: amuma ọhù ugha, na nke iju arusi ase, na nke ihe-efu, na nke aghughọ nke obi-ha, ka ha nēburu unu. 15 N'ihi nka ka Jehova ji kwue okwu di otú a bayere ndi-amuma ahu ndi nēbu amuma n'aha m, ma Mu onwem eziteghi ha, ma ha onwe-ha nāsi, Mma-agha na oké unwu agaghi-adi n'ala nka: Ọ si, Agēji mma-agha, ji kwa oké unwu, me ka ndi-amuma ahu gwusia. 16 Ọzọ, ndi ahu nke ha onwe-ha nēburu amuma gābu ndi anētufu n'èzí nile nke Jerusalem n'ihi oké unwu na mma-agha; ọ dighi kwa onye nēlì ozu ha gēnwe, ha onwe-ha, na ndinyom-ha, na umu-ha ndikom, na umu-ha ndinyom: n'ihi na M'gāwukwasi ha ihe ọjọ ha. 17 I gāgwa kwa ha okwu a, si, Ka anya-miri si n'anyam erùda abali na ehihie, ka ha ghara kwa iguzo du; n'ihi na nb͕aji ukwu na aka di uku ka ejiworo b͕aji ada ndim nāmaghi nwoke, ọ bu ntiputa-ọnyá nke jọrọ njọ nke-uku. 18 Ọ buru na apuam je n'ọhia, le, ndi ejiworo mma-agha b͕u! ma ọ buru na abàm n'obodo a, le, ndi nāria ọria site n'oké unwu! n'ihi na ma onye-amuma ma onye-nchu-àjà, ha akpaghariwo n'ala, ma ha amaghi ihe. 19 Ì jusiwo Juda? ọ̀ bu Zaion ka nkpuru-obi-Gi sọworo oyi? gini mere I ji tib͕u ayi, ma ọ dighi ọgwugwọ diri ayi? Ayi lere anya udo, ma ọ dighi ezi ihe biara; ayi lere anya mb͕e ọgwugwo, ma, le, oké egwu! 20 Jehova, ayi mara nmebi-iwu-ayi, na ajọ omume nna-ayi-hà: n'ihi na ayi emehiewo megide Gi. 21 Elelìla ayi, n'ihi aha-Gi; akpọla oche-eze nke ebube-Gi ihe-nzuzu: cheta, emebila ọb͕ub͕a-ndu-Gi ayi na Gi b͕ara. 22 Ọ̀ di ihe ọ bula n'etiti ihe-efu nile nke mba nile nke nēme ka miri zo? ma-ọbu elu-igwe, hà gēnye oké miri-ozuzo? ọ̀ bughi Gi onwe-gi bu Onye ahu, Jehova, bú Chineke-ayi? ayi gēle kwa anya Gi; n'ihi na Gi onwe-gi emewo ihe ndia nile.

Jeremaia 15

1 Jehova we sim, Ọ buru na Moses na Samuel eguzo n'irum, nkpuru-obim agaghi-adi n'ebe ndi nka nọ: chupu ha n'irum, ka ha pu kwa. 2 O gēru kwa, mb͕e ha gāsi gi, Òle ebe ayi gāpu? i gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova siri: Ndi diri ọnwu gāpukuru ọnwu; ndi diri mma-agha gāpukuru mma-agha; ndi diri oké unwu gāpukuru oké unwu; ndi diri ndọta-n'agha gāpukuru ndọta-n'agha. 3 M'gēme kwa ka ab͕uru ihe anọ buru ndi-nlekọta-ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): mma-agha ib͕u eb͕u, na nkita idọb͕u adọb͕u, na anu-ufe nke elu-igwe, na anumanu nke uwa, iripia na ibibi. 4 M'gēwere kwa ha nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari, n'ihi Manase nwa Hezekaia, bú eze Juda, n'ihi ihe o mere na Jerusalem. 5 N'ihi na ònye gēnwe ọmiko n'aru gi, Jerusalem? ma-ọbu ònye gēgosi gi ebere o nwere n'aru gi? ma-ọbu ònye gēwezuga onwe-ya iju ajuju bayere udo-gi? 6 Gi onwe-gi arapuwo Mu onwem, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), azu ka i nālaghachi: M'we setipu akam imegide gi, we bibie gi; ike ncheghari agwusiwom. 7 M'we were ihe-nfucha fucha ha n'ọnu-uzọ-ama nke ala nka; ab͕abawom ha aka umu, emewom ka ndim la n'iyì; ha esighi n'uzọ nile ha lata. 8 Ndinyom-ha di-ha nwuru ababigaworom uba ókè kari ájá nke oké osimiri nile: emewom ka onye nke nāpunara madu ihe biakute ha n'etiti-ehihie imegide nne nke umu-okorọbia: emewom ka nhuju-anya na obi-ọlulọ-miri dakwasi ya na mberede. 9 Nwayi nke muworo umu asa atalatawo; o kubìwo ume; anyanwu-ya adawo mb͕e ubọchi fọduru; ihere emewo ya, o we nwe iru-ihere: ọzọ, ndi-ha fọduru, ọ bu n'aka mma-agha ka M'gēnye ha n'iru ndi-iro-ha; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 10 Ahuhu dirim, nnem, na i muwom onye-ọ̀gù na onye-esem-okwu n'ebe uwa nile di! ebinyeghm ego n'uma; madu ebinyeghkwam ego n'uma; ma onye ọ bula nime ha nākọcham. 11 Jehova siri, N'ezie atọpuwom i ime ezi ihe; n'ezie emewom ka onye-iro-gi riọ gi aririọ na mb͕e ihe ọjọ na nime mb͕e nkpab͕u. 12 Àgētiji ígwè si n'Ugwu puta, na ọla? 13 Ume-gi na àkù-gi nile ka M'gēnye ka ọ buru ihe-nluta-n'agha, ọ bughi n'ihi ọnu-ahia, ma n'ihi nmehie-gi nile, ọbuná n'ókè-ala-gi nile. 14 M'gēme kwa ka ha soro ndi-iro-gi gabiga n'ala i nāmagh: n'ihi na amuyewo ọku n'iwem, n'aru unu ka ọ gēre. 15 Gi mara, Jehova: chetam, letakwam, we bọ̀rọm ndi nēsob͕um ọ́bọ̀; ewepulam n'eweghi-iwe-ọsọsọ nke Gi: mara na eburuwom ita-uta n'ihi Gi. 16 Achọputawo okwu-Gi, m'we rie ha; okwu-Gi we ghọrọm ihe-obi-utọ na ọṅù obim: n'ihi na akpọkwasiwom aha-Gi, Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha. 17 Anọdughm ala n'ìzù nzuzo nke ndi nāchì ọchì nke-uku, aṅurighkwam ọṅu: n'ihi aka-Gi náním otú nọduru ala; n'ihi na oké iwe ka I jiworo mejuem. 18 N'ìhi gini ka ihe-nb͕um digidere mb͕e nile? n'ìhi gini ka ntiputa-ọnyám nādighi ngwọta? ọ juwo ka agwọta ya. Ì gāburum nání ihe di ka miri-iyi nārafu arafu, dika miri na-ekwesighi ntukwasi-obi? 19 N'ihi nka ka Jehova ji si otú a, Ọ buru na i lata, M'gēme kwa ka i lata, n'irum ka i gēguzo; ọ buru na i me ka ihe di oké ọnu-ahia si n'ihe jọb͕uru onwe-ya puta, dika ọnum ka i gābu: ndi ahu gālaghachikute gi, ma gi onwe-gi agaghi-alaghachikute ha. 20 M'gēme kwa gi ka i ghọrọ ndi nka mb͕idi ọla ewusiri ike; ha gēbuso kwa gi agha, ma ha agaghi-enwe ike imegide gi: n'ihi na gi ka M'nọyere izọputa gi na inaputa gi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 21 M'gānaputa kwa gi n'aka ndi ọjọ, b͕aputa gi n'aka ndi nēme ka madu ma jijiji.

Jeremaia 16

1 Okwu Jehova we ruem nti, si 2 I gaghi-alutara onwe-gi nwunye, i gaghi-enwe kwa umu-ndikom na umu-ndinyom n'ebe a. 3 N'ihi na okwu di otú a ka Jehova kwuru bayere umu-ndikom baye-kwa-ra umu-ndinyom, ndi amuru n'ebe a, baye-kwa-ra nne-ha ndi muru ha, baye-kwa-ra nna-ha ndi muru ha n'ala nka, si, 4 Site n'ọnwu nke ọria di iche iche ka ha gānwu; agaghi-etiri ha aka n'obi, agaghi-elì kwa ha; ǹsí-anu n'elu ala ka ha gāghọ: ha gēsite kwa na mma-agha, site kwa n'oké unwu, gwusia; ozu-ha gāghọ-kwa-ra anu-ufe nke elu-igwe, ghọ-kwa-ra anumanu nke uwa, ihe-oriri. 5 N'ihi na otú a ka Jehova siri, Abala n'ulo nke ikwa-ozu, eje-kwa-la iti aka n'obi, egosi-kwa-la ha ebere i nwere n'aru ha: n'ihi na ewepuwom udom n'ebe ndi nka nọ, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), bú ebere na obi-ebere nile. 6 Ha gānwu kwa, ma ndi uku ma ndi ntà, n'ala nka: agaghi-elì ha, madu agaghi-eti-kwa-ra ha aka n'obi, madu agaghi-ebì kwa onwe-ya mma, ọ gaghi-eme-kwa-ra ha isi-nkwọcha: 7 agaghi-ekesara ha nri n'iru-újú, ikasi madu obi bayere onye nwuru anwu; agaghi-eme kwa ka ha ṅua iko nkasi-obi bayere nna madu ma-ọbu bayere nne madu. 8 Ọzọ, n'ulo nke oké oriri ka i nāgaghi-abà inọyere ha iri ihe na iṅu ihe-ọṅuṅu. 9 N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Le, M'gaje ime ka olu nke obi-utọ na olu ọṅù na olu nwoke nālu nwunye ọhu na olu nwanyi anālu ọhu kwusi n'ebe a n'anya-unu na n'ubọchi-unu. 10 O gēru kwa, mb͕e i gēgosi ndi nka okwu ndia nile, ha ewe si gi, N'ìhi gini ka Jehova kwuworo ihe ọjọ uku a nile megide ayi? ma-ọbu gini bu ajọ omume-ayi? ma-ọbu gini bu nmehie-ayi nke ayi mehieworo megide Jehova, bú Chineke-ayi? 11 I gāsi kwa ha, N'ihi na nna-unu-hà arapuwo Mu onwem, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ha we jeso chi ọzọ di iche iche, fè ha, kpọ isi ala nye ha, ma Mu ka ha rapuru, ọ bu kwa iwum ka ha nēdebeghi; 12 unu onwe-unu emewo kwa ihe ọjọ kari nna-unu-hà; n'ihi na, le, unu nējeso, onye ọ bula isi-ike nke obi ọjọ ya unu we ghara igem nti: 13 M'gātupu kwa unu n'elu ala nka tukwasi unu n'ala ahu nke unu nāmaghi, ma ọ bu unu onwe-unu ma -ọbu nna-unu-hà; unu gēfè kwa chi ọzọ di iche iche n'ebe ahu ehihie na abali; n'ihi na M'gaghi-emere unu amara. 14 N'ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na agaghi-asi kwa ọzọ, Jehova nādi ndu, bú Onye mere ka umu Israel si n'ala Ijipt rigoputa; 15 kama agāsi, Jehova nādi ndu, bú Onye mere ka umu Israel si n'ala Ugwu na n'ala nile ebe Ọ chusara ha-ri rigoputa: M'gēme kwa ka ha lata n'ala ahu nke M'nyere ndi bu nna-ha. 16 Le, M'gaje iziga kpọ ọtutu ndi-ọ́kù, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ha gākùru ha; emesia M'gēziga kpọ ọtutu ndi-ntá, gēsi n'elu ugwu ọ bula, na n'elu ugwu ntà ọ bula, na nime nb͕awa nkume nile di elu, chu ntá ha. 17 N'ihi na anyam abua dikwasi n'uzọ nile ha: ezopughi ha n'irum, ezobeghi kwa ajọ omume-ha pua n'iru anyam abua. 18 Ma M'gēburu uzọ kwughachi ajọ omume-ha na nmehie-ha okpukpu abua; n'ihi na ha emewo alam ka ọ ghara idi nsọ n'ozu nke nile ha nke nāsọ oyi, ọ bu kwa ihe-árú nile ha ka ha ji kpojue ihe-nketam. 19 Jehova, ikem, na ebem siri ike, na ebe-nb͕abàm n'ubọchi nkapab͕u, Gi ka mba nile gābiakute site na nsọtu nile nke uwa, si, Nání okwu-agha ka nna-ayi-hà ketaworo, bú ihe-efu na ihe nke ọ nadighi urù ha bara. 20 Madu, ọ̀ gēmere onwe-ya chi di iche iche, ọ bu ezie na ihe ahu abughi chi? 21 N'ihi nka, le, M'gaje ime ka ha mara, na mb͕e a ka M'gēme ka ha mara akam na idi-ikem; ha gāmara kwa na aham bu Jehova.

Jeremaia 17

1 Ejiwo pen ígwè, ji kwa ọnu-ọnu diamond, de nmehie Juda: atuwo ya n'elu mbadamba nkume, bú obi-ha, na n'elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà nile nke umu; 2 ebe umu-ha nēcheta ebe-ichu-aja nile ha na Asherim-ha n'akuku osisi ndu n'elu ugwu ntà ha nile di elu. 3 Gi ugwum nke di n'ọhia, ume-gi na àkù-gi nile ka M'gēnye ka ọ buru ihe-nluta-n'agha, M'gēnye kwa ebe-gi nile di elu, n'ihi nmehie, n'ókè-ala-gi nile. 4 I gārapu kwa, ọbuná site n'onwe-gi, ihe-nketa-gi nke M'nyere gi; M'gēme kwa ka i fè ndi-iro-gi n'ala ahu nke i nāmagh: n'ihi na ọku ka unu muyeworo n'iwem, rue mb͕e ebighi-ebi ka ọ gēre. 5 Otú a ka Jehova siri: Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu nke nātukwasi madu obi, we me ka anu-aru, bú madu, buru ogwe-aka-ya, onye obi-ya nēsi kwa n'ebe Jehova nọ wezuga onwe-ya. 6 Ọ gādi kwa ka osisi tamarisk n'ala ihe nādighi, ọ gaghi-ahu kwa mb͕e ọdi-nma nābia; ma ọ gēbi n'ebe nile kpọrọ nku n'ọzara, bú ala nnú ebe madu nēbighi. 7 Onye agọziri agọzi ka nwoke ahu bu nke nātukwasi Jehova obi, onye Jehova bu ihe-ntukwasi-obi-ya. 8 Ọ gādi kwa ka osisi akuworo n'akuku miri, ọ bu kwa n'akuku osimiri ka ọ nāwasa nkpọrọgwu-ya, ọ dighi-atu kwa egwu mb͕e okpom-ọku nābia, ma akwukwọ-ya gābu akwukwọ ndu; ọzọ, n'arọ nb͕ochi miri-ozuzo ọ gaghi-echeb͕u onwe-ya, ọ gaghi-apu kwa n'imì nkpuru. 9 Obi di aghughọ kari ihe nile, ihe nādighi ngwọta ka ọ bu kwa: ònye gāmara ya? 10 Mu onwem, bú Jehova, nēnyocha obi, nānwa akuru, ọbuná inye onye ọ bula dika uzọ-ya nile si di, dika nkpuru nke omume-ya nile si di. 11 Dika ọkwa nke nēkpokọba umu nke ọ nāmughi, otú a ka onye nākpa àkù, ma ọ kpaghi ya n'ikpé ziri ezi, si di; n'etiti ubọchi ndu-ya ọ gārapu ya, n'ikpe-azu-ya o we buru onye-nzuzu. 12 Oche-eze nke di ebube, nke di n'elu site na mbu, ọnọdu nke ebe nsọ ayi, 13 olile-anya Israel, ka Jehova bu, ihere gēme ndi nile nārapu Gi: ndi nēsi n'ebe M'nọ wezuga onwe-ha, n'ala ka agēde ha, n'ihi na ha arapuwo isi-iyi nke miri nēnye ndu, bú Jehova. 14 Me ka m'diri ndu, Jehova, m'we diri ndu; zọputam, ewe zọputam: n'ihi otutom ka I bu. 15 Le, ndi ahu nāsim, Òle ebe okwu Jehova di? biko, ya bia. 16 Ma mu onwem, anukpọghm ipu n'iso Gi n'izù aturu; ọzọ, ubọchi nādighi ngwọta, achọsighm ya ike; Gi onwe-gi mara: ihe si n'eb͕ub͕ere-ọnum puta, na ncherita-iru Gi ka ọ diworo. 17 Aghọlam ihe-ujọ: ebe-nb͕abàm ka I bu n'ubọchi ihe ọjọ. 18 Ka ihere me ndi nēsob͕um, ma ka ihere ghara ime mu onwem; ka ndi ahu tua ujọ, ma ka mu onwem ghara itu ujọ: me ka ubọchi ihe ọjọ biakwasi ha, were kwa okpukpu ntipia abua tipia ha. 19 Otú a ka Jehova sirim: Je, guzo n'ọnu-uzọ-ama nke umu ndim, nke ndi-eze Juda nēsi abata, nke ha nēsi apu kwa, guzo kwa n'ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem; 20 si ha, Nurunu okwu Jehova, unu ndi-eze Juda, na Juda nile na ndi nile bi na Jerusalem, bú ndi nābata n'ọnu-uzọ-ama ndia: 21 otú a ka Jehova siri: Lezienu onwe-unu anya, unu ebu-kwa-la ibu n'ubọchi-izu-ike, unu ebubà-kwa-la ya n'ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem; 22 unu agaghi-ebupu kwa ibu n'ulo-unu n'ubọchi-izu-ike, ọ bu kwa ozi ọ bula ka unu nāgaghi-eje: ma donu ubọchi-izu-ike nsọ, dika M'nyere nna-unu-hà iwu; 23 ma ha anughi, ha atọghi kwa nti-ha n'ala, ha we kwesie olu-ha ike, ka ha we ghara inu, ghara kwa inara idọ-aka-na-nti. 24 O gēru kwa, ọ buru na unu egem nti nke-ọma, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ighara ibubata ibu n'ọnu-uzọ-ama nile nke obodo a n'ubọchi-izu-ike, kama ya ido ubọchi-izu-ike nsọ, ighara ije ozi ọ bula nime ya; 25 ndi-eze na ndi-isi, ndi nānọkwasi n'oche-eze Devid, gābata kwa n'ọnu-uzọ-ama nile nke obodo a, bú ndi nānọkwasi n'ub͕ọ-ala na n'inyinya, ha onwe-ha, na ndi-isi-ha, ndi Juda, na ndi bi na Jerusalem: obodo a gānọgide kwa rue mb͕e ebighi-ebi. 26 Ha gēsi kwa n'obodo nile nke Juda, si kwa n'ebe nile di Jerusalem buruburu, si kwa n'ala Benjamin, si kwa n'ebe di ala ala, si kwa n'ugwu, si kwa na Negeb, bia, nēwebata ihe àjà-nsure-ọku, na àjà ọzọ, na onyinye-inata-iru-ọma, na frankincense, nēwebata kwa ekele, n'ulo Jehova. 27 Ma ọ buru na unu egeghm nti ido ubọchi-izu-ike nsọ, na ighara ibū ibu bata n'ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem n'ubọchi-izu-ike; M'gēsuye kwa ọku n'ọnu-uzọ-ama-ya nile, ọ gērichapu kwa ulo-elu nile nke Jerusalem, agaghi-emenyu kwa ya.

Jeremaia 18

1 Okwu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, si, 2 Bilie, rida n'ulo ọkpu-ite, ọ bu kwa n'ebe ahu ka M'gēme ka i nu okwum. 3 M'we rida n'ulo ọkpu-ite, ma, le, ọ nēje ozi-ya n'elu wheel-ya abua. 4 Ewe bibie ihe onye ahu ji urọ akpu n'aka ọkpu-ite ahu, o we kpu kwa ya ọzọ ihe di iche, dika o ziri ezi n'anya ọkpu-ite ahu ikpu ya. 5 Okwu Jehova we ruem nti, si, 6 Àpughm ime unu dika ọkpu-ite a mere, unu ulo Israel? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Le, dika urọ si di n'aka ọkpu-ite a, otú a ka unu onwe-unu di n'akam, unu ulo Israel. 7 N'otù ntabi-anya ahu mb͕e M'nēkwu okwu bayere mba ọ bula, iropu ya na ikwada ya na ime ka ọ la n'iyì; 8 ọ buru na mba ahu nke M'kwuworo okwu bayere ya esi n'ihe ọjọ ya chigharia, M'gēchèghari kwa n'ihe ọjọ ahu nke M'chère ime ya. 9 Ọzọ, n'otù ntabi-anya ahu mb͕e M'nēkwu okwu bayere mba ọ bula, baye-kwa-ra ala-eze ọ bula, iwu ya dika ulo na iku ya dika osisi; 10 ọ buru na o me ihe jọrọ njọ n'anyam, we ghara ige nti n'olum, M'gēchèghari kwa n'ezi ihe ahu, nke M'siri na M'gēji me ya nma. 11 Ma ub͕u a, biko, gwa ndi Juda, gwa kwa ndi bi na Jerusalem, okwu, si, Otú a ka Jehova siri: Le, Mu onwem nākpu ihe ọjọ megide unu, nēchè kwa èchìchè megide unu: biko, sinu, onye ọ bula n'uzọ ọjọ ya, lata, me kwa ka uzọ nile unu na omume nile unu di nma. 12 Ma ha siri, Ntukwasi-obi adigh: n'ihi na èchìchè nile nke ayi ka ayi nējeso, ayi nēme kwa, onye ọ bula ihe isi-ike nke obi ọjọ ya. 13 N'ihi nka ka Jehova ji si otú a: Biko, juanu n'etiti mba nile, si, Ònye nuworo ihe di ka ndia? ihe jọb͕uru onwe-ya nke-uku ka nwa-ab͕ọghọ Israel nke nāmaghi nwoke meworo. 14 Snow nke Lebanon, ọ̀ gārapu oké nkume nke ọhia? ma-ọbu miri oyi nke si n'ala ọzọ erù, ọ̀ gātada? 15 N'ihi na ndim echezọwom, ihe-efu ka ha sureworo ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ nye; ha we me ka ha su ngọngọ n'uzọ nile ha, bú uzọ-ije nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga, ije ije n'okporo-uzọ di iche iche, bú uzọ anātulighi atuli; 16 ime ka ala-ha ghọ ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ mb͕e ebighi-ebi; ọ gēju onye ọ bula nke nāgabiga n'akuku ya anya, o gēfufe kwa isi-ya. 17 Dika ifufe Iru-anyanwu ka M'gāchusa ha n'iru onye-iro; azu, ọ bughi iru, ka M'gēme ka hu ha n'ubọchi nhuju-anya-ha. 18 Ha we si, Bianu, ka ayi chè èchìchè megide Jeremaia; n'ihi na iwu agaghi-esi n'ebe onye-nchu-àjà nọ la n'iyì, ndum-ọdu agaghi-esi kwa n'ebe onye mara ihe nọ, okwu agaghi-esi kwa n'ebe onye-amuma nọ. Bianu, ka ayi were ire-ayi tib͕ue ya, ma ka ayi ghara iṅa nti n'okwu-ya nile. 19 Ṅam nti, Jehova, ge kwa nti olu ndi nālusom ọ̀gù. 20 Àgākwughachi ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe? n'ihi na ha egwuworo nkpuru-obim olùlù. Cheta nguzo m'guzoro n'iru Gi ikwu ezi ihe bayere ha, ime ka ọnuma-Gi si n'aru ha laghachi. 21 N'ihi nka were umu-ha nye oké unwu, rara kwa ha nye n'aka mma-agha; ka ndinyom-ha ghọ kwa ndi b͕ara aka nwa na ndi di-ha nwuru; ka ndikom-ha ghọ kwa ndi ọnwu b͕uru, ka umu-okorọbia-ha ghọ ndi etib͕uru na mma-agha n'agha. 22 Ka anuru iti-nkpu nke gēsite n'ulo nile ha, mb͕e I gēme ka usu ndi nāpunara madu ihe biakwasi ha na mberebe: n'ihi na ha egwuwo olùlù inwudem, ha ezobewo-kwa-ra ukwum abua ib͕udu di iche iche. 23 Ma Gi onwe-gi, Jehova, amawo ndum-ọdu nile ha imegidem ime ka m'nwua; ekpuchila ajọ omume-ha, ehichapu-kwa-la nmehie-ha n'iru Gi: ma ka ha ghọ ndi emeworo ka ha su ngọngọ n'iru Gi; meso ha na mb͕e iwe-Gi.

Jeremaia 19

1 Otú a ka Jehova siri, Je, zuta karama nke ọkpu-ite ji urọ akpu, chiri kwa ufọdu nime ndi-okenye ndim, na nime ndi-okenye ndi-nchu-àjà; 2 purue ndagwurugwu nwa Hinom, nke di n'oghere ọnu-uzọ-ama ejùjù, kpọsa n'ebe ahu okwu nile nke M'gāgwa gi: 3 si, Nurunu okwu Jehova, unu ndi-eze Juda, na ndi bi na Jerusalem; otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri, Le, M'gaje ime ka ihe ọjọ biakwasi ebe a, nke nti abua nke onye ọ bula nānu ya gāzu wuruwuru. 4 N'ihi na ha arapuwom, we ghara imata ebe a, we surere chi ọzọ di iche iche ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ nime ya, bú ndi ha nāmaghi, ha onwe-ha na ndi bu nna-ha na ndi-eze Juda; ha emejuwo kwa ebe a n'ọbara ndi nēmeghi ihe ọjọ; 5 ha ewuwo kwa ebe nile di elu nke Beal, isure umu-ha ndikom n'ọku ka ha buru àjà-nsure-ọku anāchuru Beal; nke M'nēnyeghi n'iwu, ekwughkwam ya, ọ bataghi kwa n'obim: 6 n'ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e agaghi-akpọ kwa ebe a Tofet ọzọ, ma-ọbu Ndagwurugwu nwa Hinom, kama agākpọ ya Ndagwurugwu Ob͕ub͕u. 7 M'gāwusi kwa ndum-ọdu Juda na Jerusalem n'ebe a dika miri; M'gēme kwa ka ha da site na mma-agha n'iru ndi-iro-ha, na site n'aka ndi nāchọ ndu-ha: M'gēnye kwa ozu-ha iburu anu-ufe nke elu-igwe, na iburu anumanu nke uwa, ihe-oriri. 8 M'gēme kwa ka obodo a ghọ ihe-iju-anya, ka ọ ghọ kwa ihe-ima-ọsọ; ọ gēju onye ọ bula nke nāgabiga n'akuku ya anya, ọ gāma kwa ọsọ n'ihi ihe-otiti-ya nile. 9 M'gēme kwa ka ha rie anu-aru nke umu-ha ndikom na anu-aru umu-ha ndinyom, ha gēri kwa, onye ọ bula anu-aru ibe-ya, nime nnọchigide-n'agha na nime nkpab͕u, nke ndi-iro-ha na ndi nāchọ ndu-ha nākpab͕u ha. 10 I gētiwa kwa karama ahu n'anya ndikom ahu, bú ndi nēso gi je, 11 i gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ọbuna otú a ka M'gētiwa ndi nka na obodo a, dika madu si etiwa ite ọkpu-ite, nke anāpughi imezi kwa ya ọzọ: ọ bu kwa na Tofet ka ha gēlì ozu, n'ihi na ebe ilì ozu adighi. 12 Otú a ka M'gēme ebe a, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), me kwa ndi bi ya, ọbuná ime obodo a ka ọ di ka Tofet: 13 ulo nile nke Jerusalem na ulo nile ndi-eze Juda, nke ruru árú, gādi kwa ka ebe Tofet, bú ulo nile nke ha sureworo ihe-nsure-ọku nēsì ísì uto n'elu-ha nye usu nile nke ihe elu-igwe, wusi-kwa-ra chi ọzọ di iche iche àjà-ihe-ọṅuṅu. 14 Jeremaia we si na Tofet bia, ebe Jehova zigara ya ibu amuma; o we guzo n'ogige ulo Jehova, si ndi Israel nile: 15 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri, Le, M'gaje ime ka ihe ọjọ a nile biakwasi obodo a, biakwasi kwa obodo-ya nile, bú nke M'kwuworo megide ya; n'ihi na ha ekwesiwo olu-ha ike, ka ha ghara inu okwum nile.

Jeremaia 20

1 Pashua nwa Imea, bú onye-nchu-àjà, nke bu kwa onye-nlekọta, onye-ndú n'ulo Jehova, Pashua ahu we nu ka Jeremaia nēbu amuma okwu ndia. 2 Pashua we tie Jeremaia, bú onye-amuma, ihe, tiye ya n'ọtọsi ahu nke di n'ọnu-uzọ-ama Benjamin di n'elu, nke di n'ulo Jehova. 3 O rue n'echi-ya, na Pashua mere ka Jeremaia si n'ọtọsi ahu puta. Jeremaia we si ya, Ọ dughi Pashua ka Jehova kpọworo aha-gi, kama ọ bu Megoa-misabibi. 4 N'ihi na otú a ka Jehova siri, Le, M'gaje ime gi ka i ghọrọ onwe-gi, ghọ-kwa-ra ndi nile nāhu gi n'anya, ihe-ujọ: ha gāda kwa site na mma-agha ndi-iro-ha, anya-gi abua ganāhu kwa ya: ọ bu kwa Juda nile ka M'gēnye n'aka eze Babilon, ọ gēme kwa ka ha je biri na Babilon, ọ gēji kwa mma-agha tib͕ue ha. 5 M'gēnye kwa ihe nile akpakọbara n'obodo a, na ihe nile putara na ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, na ihe-ya nile nke di oké ọnu-ahia, e, àkù nile nke ndi-eze Juda ka M'gēnye n'aka ndi-iro-ha, ndi gāluta ihe-ha n'agha, chiri ha, chibà ha na Babilon. 6 Gi onwe-gi kwa, Pashua, na ndi nile bi n'ulo-gi gēje na ndọta-n'agha: ọ bu kwa Babilon ka i gābata, ọ bu kwa n'ebe ahu ka i gānwu, ọ bu kwa n'ebe ahu ka agēlì gi, gi onwe-gi, na ndi nile nāhu gi n'anya, ndi i buworo amuma ugha. 7 I ràwom urà, Jehova, ewe ràram: I jidewom, we nwe ike karim: aghọwom ihe-ichì-ọchì ogologo ubọchi nile, madu nile ọ bula nākwam emò. 8 N'ihi na mb͕e ọ bula m'nēkwu, etim nkpu; Ihe-ike na Ipunara-madu-ihe, ka m'nākpọ nkpu: n'ihi na okwu Jehova ghọrọm ihe-ita-uta na ihe-ikwa-emò ogologo ubọchi nile. 9 M'we si, M'gaghi-ehota Ya, m'gaghi-ekwu kwa okwu ọzọ n'aha-Ya. O we di n'obim dika ọku nēre ere nke emechibidoro n'ọkpukpum nile, ike gwu-kwa-ram inagide ya, enweghkwam ike. 10 N'ihi na anuwom akukọ ọjọ nke ọtutu madu, ujọ dim buruburu. Gosinu, ayi gēgosi kwa ya, ka ha nāsi, bú ndi nile mu na ha di n'udo, ndi nēche nche n'akukum; eleghi anya agāràra ya, ayi ewe nwe ike imegide ya, bọ̀ọ ọ́bọ̀-ayi n'aru ya. 11 Ma Jehova nọyerem dika dike nke nēme ka ama jijiji: n'ihi nka ndi nēsob͕um gāsu ngọngọ, ha agaghi-enwe kwa ike: ihere gēme ha nke-uku, n'ihi na ha enweghi uche, agaghi-echezọ ọnọdu-ihere di mb͕e ebighi-ebi nke etiyere ha. 12 Ma, Gi Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Onye nānwa onye ezi omume, Onye nāhu akuru na obi, ka m'hu ọ́bọ̀-Gi nke I gābọ̀ ha; n'ihi na Gi ka m'kpugheworo okwu-ikpém. 13 Bùkuenu Jehova abù, tonu Jehova: n'ihi na Ọ naputawo nkpuru-obi nke ob͕eye n'aka ndi nēme ihe ọjọ. 14 Ihe anābu ọnu ka ubọchi ahu bu nke amurum nime ya: ubọchi nke nnem murum, ya ghara ibu nke agọziri agọzi. 15 Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu nke ziri nnam ozi, si, Amutara gi nwa-nwoke; nēme ka ọ ṅuria ọṅu nke-uku. 16 Ka nwoke ahu di kwa ka obodo nile nke Jehova kwaturu, ghara ichèghari: ya nu kwa iti-nkpu n'ututu, na iti-nkpu agha n'etiti-ehihie; 17 n'ihi na o meghi ka m'nwua site n'afọ nnem; nnem ewe ghọrọm ílì, afọ-ya anēburum mb͕e ebighi-ebi. 18 N'ìhi gini kwa ka m'siri n'afọ nnem puta ihu ọnọdu ọjọ na nwuta, ewe ji ihere me ka ubọchim nile gwusia?

Jeremaia 21

1 Okwu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, mb͕e eze, bú Zedekaia, zigara ya Pashua nwa Malkija, na Zefanaia nwa Maaseia, bú onye-nchu-àjà, si, 2 Biko, juara ayi Jehova ase; n'ihi na Nebukadreza, bú eze Babilon, ebusowo ayi agha: eleghi anya Jehova gēmeso ayi dika oké ọlu-Ya nile si di, we me ka o si n'aru ayi rigo la. 3 Jeremaia we si ha, Otú a ka unu gāsi Zedekaia: 4 Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, Le, M'ganēchighari ihe agha nile nke di n'aka-unu, nke unu onwe-unu ji ebuso eze Babilon na ndi Kaldea agha, bú ndi nānọchigide unu n'agha n'azu mb͕idi obodo, M'gāchikọta kwa ha n'etiti obodo a. 5 Mu onwem gēbuso kwa unu agha n'aka eseteri eseti, na n'ogwe-aka di ike, ọbuná n'iwe, na n'ọnuma, na n'oké iwe. 6 M'gētib͕u kwa ndi bi n'obodo a, ma madu ma anumanu: n'ajọ ọria uku nēfe efe ka ha gānwu. 7 Ma emesia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gēwere Zedekaia, bú eze Juda, na ndi-orù-ya, na ndim, bú ndi puru n'ajọ ọria ahu nke nēfe efe, pu kwa na mma-agha, na n'oké unwu, fọduru n'obodo a, nye ha n'aka Nebukadreza, bú eze Babilon, na n'aka ndi-iro-ha, na n'aka ndi nāchọ ndu-ha: ọ gēji kwa ọnu mma-agha tib͕u ha; ọ gaghi-emere ha ebere, ọ gaghi-enwe kwa ọmiko, ọ gaghi-enwe kwa obi-ebere. 8 Ndi nka ka i gāsi kwa, Otú a ka Jehova siri: Le, M'nēche n'iru unu uzọ ndu na uzọ ọnwu. 9 Onye nānọgide n'obodo a gānwu site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe: ma onye nāpu apu, nke nādakuru ndi Kaldea ndi nānọchigide unu n'agha, ọ gādi ndu, ndu-ya ewe ghọrọ ya ihe-nkwata. 10 N'ihi na edowom irum n'aru obodo a ime ya ihe ọjọ, ọ bughi ime ya ezi ihe, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): n'aka eze Babilon ka agēnye ya, ọ gēsure kwa ya n'ọku. 11 Ma okwu bayere ulo eze Juda, nurunu okwu Jehova: 12 unu ulo Devid, otú a ka Jehova siri, Kpenu ikpe n'ututu, naputa-kwa-nu onye anapuworo ihe n'ike n'aka onye-nmeb͕u, ka ọnumam we ghara ipu dika ọku, ghara kwa ire ere nke ọ nādighi onye ganēmenyu ya, n'ihi ihe ọjọ nke omume nile unu. 13 Le, Mu nēmegide gi, gi nwayi bi na ndagwurugwu, gi oké nkume nke ebe di lari, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); unu ndi nāsi, Ònye gāridata imegide ayi? ma-ọbu ònye gābata n'ebe-obibi nile ayi? 14 M'gēwere kwa nmehie-unu leta unu dika nkpuru omume nile unu si di, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): M'gēsuye kwa ọku n'oké ọhia-ya, ọ gērichapu kwa ihe nile di ya buruburu.

Jeremaia 22

1 Otú a ka Jehova siri: Rida n'ulo eze Juda, kwue okwu a n'ebe ahu, 2 si, Nuru okwu Jehova, gi eze Juda, onye nānọkwasi n'oche-eze Devid, gi onwe-gi, na ndi-orù-gi, na ndi-gi ndi nābata n'ọnu-uzọ-ama ndia. 3 Otú a ka Jehova siri: Menu ihe ekpere n'ikpe na ezi omume, naputa-kwa-nu onye anapuworo ihe n'ike n'aka onye-nmeb͕u: unu emejọ-kwa-la ọbìa, ma-ọbu nwa-nb͕ei, ma-ọbu nwanyi di-ya nwuru, unu emela ha ihe-ike, unu awusi-kwa-la ọbara nēmeghi ihe ọjọ n'ebe a. 4 N'ihi na ọ buru na unu eme ihe a n'ezie, ndi-eze ndi nānọchi Devid n'oche-eze-ya gābata kwa n'ọnu-uzọ-ama nke ulo a, bú ndi nānọkwasi n'ub͕ọ-ala na n'inyinya, ya onwe-ya, na ndi-orù-ya, na ndi-ya. 5 Ma ọ buru na unu anughi okwu ndia, ejiwom Onwem ṅu iyi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na nkpọnkpọ ebe ka ulo a gāghọ. 6 N'ihi na ihe di otú a ka Jehova kwuru bayere ulo eze Juda, si: Gilead ka i burum, bú isi Lebanon: ma aghaghm ime gi ka i ghọ ọzara, na obodo nke madu nēbighi. 7 M'gēdo kwa ndi-nbibi nsọ imegide gi, onye ọ bula na ihe-agha-ya: ha gēb͕utu kwa osisi cedar gi nile kachasi nma, me ka ha dakwasi n'ọku. 8 Ọtutu mba gāgabiga kwa n'akuku obodo a, ha gāsirita kwa ibe-ha n'otù n'otù, N'ìhi gini ka Jehova meworo obodo uku a otú a? 9 Ha gāsi kwa, Ọ bu n'ihi na ha rapuru ọb͕ub͕a-ndu nke Jehova, bú Chineke-ha, we kpọ isi ala nye chi ọzọ di iche iche, fè ha. 10 Unu akwalara onye nwuru anwu ákwá, unu egosi-kwa-la ya ebere unu nwere n'aru ya: kwasierenu onye-ije ahu ike; n'ihi na ọ gaghi-alata kwa ọzọ, ọ gaghi-ahu kwa ala amuru ya ọzọ. 11 N'ihi na okwu di otú a ka Jehova kwuru bayere Shalum nwa Josaia, bú eze Juda, nke bu eze n'ọnọdu Josaia, bú nna-ya, nke siri n'ebe a pua, si: Ọ gaghi-alata kwa n'ebe ahu ọzọ; 12 kama n'ebe ahu nke ha mere ya ka ọ je biri, n'ebe ahu ka ọ gānwu, ma ala nka ka ọ nāgaghi-ahu kwa ọzọ. 13 Ahuhu gādiri onye ji ajọ omume ewu ulo-ya, nke ji kwa ikpé nēzighi ezi ewu ime-elu-ya nile; nke nēme ka madu-ibe-ya fè òfùfè n'efu, ọ dighi-enye kwa ya ugwọ-ọlu-ya; 14 onye nāsi, M'gēwuru onwem ulo uku na ime-ulo-elu di iche iche sara mbara, onye nēmere onwe-ya ka window-ya sa mbara; eji kwa osisi cedar machita elu-ya, eji kwa ihe-otite nācha uhie uhie te ya. 15 Ì gābu eze, n'ihi na gi onwe-gi nānu ọku n'obi ika ndi ọzọ n'iji osisi cedar ewu ulo? nna-gi, ò righi ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, me kwa ihe ekpere n'ikpe na ezi omume? mb͕e ahu ka ọ diri ya nma. 16 O kpere ikpe onye ewedara n'ala na ob͕enye; mb͕e ahu ka ọ di nma. Nka abughi imaram? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 17 Ma anya-gi abua na obi-gi adighi n'ihe ọ bula ma-ọbughi nání n'urù nēzighi ezi gi, na n'iwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ, na n'imeb͕u emeb͕u, na n'izọpia-azọpia, ime ya. 18 N'ihi nka ka Jehova ji kwue okwu di otú a bayere Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, si: Ha agaghi-etiri ya aka n'obi, si, Éwù, nwa-nnem nwoke! ma-ọbu, Éwù, nwa-nnem nwanyi! ha agaghi-etiri ya aka n'obi, si, Éwù, onye-nwe-ayi! ma-ọbu, Éwù, ebube-ya! 19 Olìlì nke inyinya-ibu ka agēji lìe ya, agādọrọ ya, tufue ya n'ebe di anya n'azu ọnu-uzọ-ama Jerusalem. 20 Rigo na Lebanon, ti kwa nkpu; me kwa ka olu-gi da udà na Beshan: si kwa n'Abarim tie nkpu; n'ihi na etipiawo ndi nile nāhu gi-ri n'anya. 21 Agwaram i okwu n'udo-gi; ma i siri, M'gaghi-anu. Nka bu uzọ-gi site na mb͕e i di na nwata, na i geghi nti olum. 22 Ndi-ọzùzù-aturu-gi nile ka ifufe gāzù dika aturu, ndi nāhu gi n'anya gēje na ndota-n'agha: n'ezie mb͕e ahu ka ihere gēme gi, agētiye kwa gi n'ọnọdu-ihere, site n'ihe ọjọ gi nile. 23 Gi nwanyi nēbi na Lebanon, nke nālu akwu-gi n'etiti osisi cedar nile, le, ka i si buru onye agēmere amara nke-uku mb͕e ihe-nb͕u nābiakwasi gi, nb͕ali dika nke nwanyi ime nēme! 24 Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ọ buru si na Konaia nwa Jehoiakim, bú eze Juda, bu nb͕a-aka-akàrà n'aka-nrim, ma ọbuná n'ebe ahu ka M'gādọpu gi; 25 M'gēnye kwa gi n'aka ndi nāchọ ndu-gi, na n'aka ndi gi onwe-gi nātu ujọ ha, bú n'aka Nebukadreza, bú eze Babilon, na n'aka ndi Kaldea. 26 M'gētufu kwa gi na nne-gi onye muru gi, rue ala ọzọ, ebe anāmughi unu; ọ bu kwa n'ebe ahu ka unu gānwu. 27 Ma n'ala ahu nke ha onwe-ha nātukwasi nkpuru-obi-ha, si na ha gālaghachi n'ebe ahu, n'ebe ahu ka ha nagaghi-alaghachi. 28 Ọ̀ bu ite elelìri elelì nke etipiara etipia ka nwoke a, bú Konaia, bu? ọ̀ bu ihe nke nādighi-atọ utọ? gini mere eji tufu ha-ri, ya onye-ya na nkpuru-ya, tukwasi ha n'ala nke ha nāmaghi? 29 Ala, ala, ala, nuru okwu Jehova. 30 Otú a ka Jehova siri, Denu nwoke a n'akwukwọ na ọ bu onye b͕a aka nwa, bú nwoke nke ihe nāgaghi-agara nke-ọma n'ubọchi-ya nile: n'ihi na ọ dighi onye ọ bula nime nkpuru-ya ihe gāgara nke-ọma, nke ganānọkwasi n'oche-eze Devid, nāchi kwa achi ọzọ na Juda.

Jeremaia 23

1 Ahuhu gādiri ndi-ọzùzù-aturu ndi nēme ka ìgwè ewu na aturu nke ebe-ita-nrim la n'iyì, kpasa ha; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 2 N'ihi nka ka Jehova, bú Chineke nke Israel, ji kwue okwu di otú a megide ndi-ọzùzù-aturu ndi nāzù ndim dika aturu, si: Unu onwe-unu akpasawo ìgwè ewu na aturu nkem, chusa ha, unu elekọtaghi kwa ha; le, M'gaje iwere ihe ọjọ nke omume nile unu leta unu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 3 Mu onwem gāchikọta kwa ìgwè ewu na aturu nkem fọduru site n'ala nile ebe M'chusaworo ha, M'gēme kwa ka ha lata n'ebe-ita-nri-ha; ha gāmu kwa ọmùmù, ba uba. 4 M'gēme kwa ka ndi-ọzùzù-aturu biliere ha, ndi gāzù ha: ha agaghi-atu kwa egwu ọzọ, ha agaghi-atu kwa ujọ, agaghi-ele kwa anya otù efu nime ha na o furu efu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 5 Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gēme ka Ihe-opupú nke nēme ezi omume biliere Devid, otù Eze gābu kwa eze, ọ gēnwe kwa uche, me ihe ekpere n'ikpe na ezi omume n'ala nka. 6 N'ubọchi-ya ka agāzọputa Juda, Israel gēbi kwa na ntukwasi-obi: nka bu kwa aha-ya agākpọ ya, Jehova bu ezi omume-ayi. 7 N'ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na ha agaghi-asi kwa ọzọ, Jehova nādi ndu, bú Onye mere ka umu Israel si n'ala Ijipt rigoputa; 8 kama ha gāsi, Jehova nādi ndu, bú Onye mere ka nkpuru ulo Israel si n'ala Ugwu na n'ala nile ebe M'chusara ha-ri rigoputa, bata; ha gēbi kwa n'elu ala nke aka ha. 9 Okwu bayere ndi-amuma. Obim tiwara etiwa nimem, ọkpukpum nile emewo nkpatu; adiwom ka onye ṅubigaworo manya ókè, na dika nwoke nke manya-vine bàworo n'anya nke-uku; n'ihi Jehova, na n'ihi okwu nsọ Ya nile. 10 N'ihi na ala nka juputara na ndi nākwa iko; n'ihi na site n'ọb͕ub͕a-iyi ala nka nēru újú; ebe-ita-nri nile nke ọzara akpọwo nku; ọb͕ub͕a-ọsọ-ha di kwa njọ, idi-ike-ha abughi kwa ihe ziri ezi. 11 N'ihi na emeruwo ma onye-amuma ma onye-nchu-àjà; e, n'ulom ka M'chọputaworo ihe ọjọ ha; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 12 N'ihi nka uzọ-ha gādi ha ka ebe nālọ alọ n'oké ọchichiri: agāchu ha, ha ewe dabà nime ya: n'ihi na M'gēme ka ihe ọjọ biakwasi ha, n'arọ nleta-ha; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 13 Ọ bu kwa n'aru ndi-amuma Sameria ka M'huworo ihe-nzuzu; ha jiri Beal bu amuma, we me ka ndim, bú Israel, kpafue. 14 Ọzọ, n'aru ndi-amuma Jerusalem ka M'huworo ihe jọb͕uru onwe-ya; ha nākwa iko, nējeghari kwa n'okwu-ugha, ha emewo kwa ka aka ndi nēme ihe ọjọ di ike, ha we ghara isi, onye ọ bula n'ihe ọjọ ya, lata: ha nile aghọworom ihe di ka Sọdọm, ndi bi nime ya aghọwo-kwa-ram ihe di ka Gọmọra. 15 N'ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha ji kwue okwu di otú a bayere ndi-amuma ndia, si: Le, M'gaje ime ka ha rie wormwood, M'gēme kwa ka ha ṅua miri ńsí; n'ihi na ndi-amuma nke Jerusalem ka nmeru puworo je rue ala nka nile. 16 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Unu egela nti n'okwu nile nke ndi-amuma ahu ndi nēburu unu amuma; ndi nēme unu ihe-efu ka ha bu: ọhù nke obi-ha ka ha nēkwu, ha adighi-ekwu site n'ọnu Jehova. 17 Ha nọ nāsi ndi nēlelìm, Jehova ekwuwo okwu, si, Udo gādiri unu; ọ bu kwa onye ọ bula nke nējeghari n'isi-ike nke obi-ya ka ha siworo, Ihe ọjọ agaghi-abiakwasi unu. 18 N'ihi na ònye guzoworo n'ìzù nzuzo nke Jehova, nke ọ gāhu nu kwa okwu-Ya? ònye ṅaworo okwum nti, we nu ya? 19 Le, oké ifufe Jehova, bú ọnuma-Ya, apuwo, ọbuná oké ifufe nēfesi ike buruburu: n'isi ndi nēmebi iwu ka ọ gēfekwasi si-ike. 20 Iwe Jehova agaghi-alaghachi azu, rue mb͕e O mere ya, ru kwa mb͕e O mere ka ihe-nzube nile nke obi-Ya guzosie ike: na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia unu gāghọta ya nke-ọma. 21 Eziteghm ndi-amuma ahu, ma ha onwe-ha b͕ara ọsọ: agwaghm ha okwu, ma ha onwe-ha buru amuma. 22 Ma ọ buru na ha guzori n'ìzù nzuzo nkem, ha gēmewori ka ndim nuru okwum nile, ha gēmewori kwa ka ha si n'uzọ ọjọ ha na n'ihe ọjọ nke omume nile ha, lata. 23 Ọ̀ bu Chineke nke nọ nso ka M'bu, ghara ibu Chineke nọ n'ebe di anya? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 24 Ọ̀ di onye ọ bula gēzobe onwe-ya n'ebe ọ bula di nzuzo, Mu onwem we ghara ihu ya anya? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Ọ̀ bughi elu-igwe na uwa ka M'juputara? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 25 Anuwom ihe ahu nke ndi-amuma siri, bú ndi nēbu amuma agha n'aham, si, Arọwom nrọ, arọwom nrọ. 26 Rùe ole mb͕e ka nka gādi n'obi ndi-amuma ndi nēbu amuma ugha; bú ndi-amuma nke nēbu amuma aghughọ nke obi-ha? 27 Ndi nēchè èchìchè ime ka ndim chezọ aham site na nrọ nile ha nke ha nēzeritara ibe-ha n'otù n'otù, dika ndi bu nna-ha chezọrọ aham site na Beal. 28 Onye-amuma nke nrọ di ya n'ọnu, ya ze nrọ-ya; ọzọ, onye ahu okwum di ya n'ọnu, ya kwue okwum n'ezi-okwu. Gini ka okporo-ọka na ọka wheat nwekọrọ? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 29 Ọ̀ bughi otú a ka ọ di? na okwum di ka ọku, (ọ bu ihe sin'ọnu Jehova puta); na dika otùtù nke nētipia nkume di elu? 30 N'ihi nka, le, Mu nēmegide ndi-amuma, (ọbu ihe si n'ọnu Jehova puta), bú ndi nēzu okwum nile n'ori, onye ọ bula n'aka ibe-ya. 31 Le, Mu nēmegide ndi-amuma, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), bú ndi nēwere ire-ha kwue ihe, si, Ọ bu ihe si Ya n'ọnu puta. 32 Le, Mu nēmegide ndi nēbu amuma nrọ ugha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ha we ze ha, me ka ndim kpafue site n'okwu-ugha nile ha na n'obi-ha nādighi n'otù ebe: ma Mu onwem eziteghi ha, enyeghkwam ha iwu; ọ dighi kwa urù ha gābara ndi nka ma-ọli; ọ bu ihe si n'onu Jehova puta. 33 Ma mb͕e ndi nka, ma-ọbu onye-amuma, ma-ọbu onye-nchu-àjà, gāju gi, si, Gini bu ibu Jehova nēbo? I gasi kwa ha, Gini bu ibu? ọ bu na arapuwom unu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 34 Ma onye-amuma ahu, ma-ọbu onye-nchu-àjà ahu, ma-ọbu ndi ahu, nke gāsi, Le, ibu Jehova nēbo: M'gēwere kwa nmehie-ya leta nwoke ahu, leta kwa ulo-ya. 35 Otú a ka unu gāsirita ibe-unu n'otù n'otù, sirita kwa nwa-nne-unu n'otù n'otù, Gini ka Jehova zaworo? na, Gini ka Jehova kwuworo? 36 Ma ibu Jehova ka unu nāgaghi-ehota kwa ọzọ: n'ihi na ibu eboro onye ọ bula bu okwu nke aka ya; unu ab͕anwewo kwa okwu nile nke Chineke di ndu, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke-ayi. 37 Otú a ka i gāsi onye-amuma, Gini ka Jehova zaworo gi? na, Gini ka Jehova kwuworo? 38 Ma ọ buru na unu asi, Le, ibu Jehova nēbo; n'ihi nka ka Jehova ji si otú a: N'ihi na unu ekwuwo okwu a, si, Le, ibu Jehova nēbo, ma eziteworom unu ozi, si, Unu asila, Le, ibu Jehova nēbo; 39 n'ihi nka, le, Mu onwem, M'gēchezọsi kwa unu, chupu unu na obodo ahu nke M'nyere unu, nye kwa nna-unu-hà, n'irum: 40 M'gētiyekwasi kwa unu ita-uta di mb͕e ebighi-ebi, ya na itiye n'ọnọdu-ihere di mb͕e ebighi-ebi, nke agaghi-echezọ echezọ.

Jeremaia 24

1 Jehova we me ka m'hu, ma, le, nkata fig abua adọbara n'iru ulo uku nke Jehova; mb͕e Nebukadreza, bú eze Babilon, mesiri ka Jekonaia nwa Jehoiakim, bú eze Juda, na ndi-isi Juda, na ndi-ọ̀kà, na ndi-uzú, si na Jerusalem je biri n'ala ọzọ, we me ka ha biarue Babilon. 2 Fig nke di nma nke-uku di n'otù nkata, dika fig nke buru uzọ cha: ma fig nke jọrọ njọ nke-uku di na nkata nke-ọzọ, nke anāgaghi-eri, site n'ijo-njọ-ha. 3 Jehova we sim, Gini ka onwe-gi nāhu, Jeremaia? M'we si, Fig; ndi bu ezi fig di nma nke-uku; ma ndi bu fig ọjọ jọrọ njọ nke-uku, nke anāgaghi-eri eri, site n'ijọ-njọ-ha. 4 Okwu Jehova we ruem nti, si, 5 Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri; Dika ezi fig ndia, otú a ka M'gāmata ndi Juda emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ndi M'siri n'ebe a ziga n'ala ndi Kaldea, ime ha nma. 6 N'ihi na M'gātukwasi ha anyam ime ha nma, M'gēme kwa ka ha lata n'ala nka: M'gēwu kwa ha dika ulo, ghara ikwada ha; M'gāku kwa ha dika osisi, ghara iropu ha. 7 M'gēnye kwa ha obi imaram, na Mu onwem bu Jehova: ha gābu-kwa-ram otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra ha Chineke: n'ihi na ha gēji obi-ha nile laghachikutem. 8 Ma dika fig ọjọ ndia, nke anāgaghi-eri eri, site n'ijọ-njọ-ha; n'ezie otú a ka Jehova siri, Otú a ka M'gēwere Zedekaia, bú eze Juda, na ndi-isi-ya, na ndi Jerusalem fọduru, bú ndi fọduru n'ala nka, na ndi bi n'ala Ijipt, nye: 9 M'gēwere ha nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari, iburu ha ihe ọjọ; ibu ihe-ita-uta, na ilu, na ihe-àkùkù, na ihe-nkọcha, n'ebe nile M'gāchusa ha. 10 M'gēziga kwa mma-agha na oké unwu na ajọ ọria nēfe efe n'etiti ha, rue mb͕e agēme ka ha gwupusia n'elu ala ahu nke M'nyere ha, nye kwa ndi bu nna-ha.

Jeremaia 25

1 Okwu nke ruru Jeremaia nti bayere ndi Juda nile n'arọ nke-anọ nke Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda; nke ahu bu arọ mbu nke Nebukadreza, bú eze Babilon; 2 bú okwu nke Jeremaia, bú onye-amuma, gwara ndi Juda nile, gwa ndi nile bi na Jerusalem, si: 3 Site n'arọ nke-iri-na-atọ nke Josaia nwa Emon, bú eze Juda, we rue ta, orú arọ na ato ndia, ka okwu Jehova ruworom nti, m'we gwa unu, nēbili n'isi-ututu nēkwu; ma unu anughi. 4 Jehova ezitewo-kwa-ra unu ndi-orù-Ya nile, bú ndi-amuma, nēbili n'isi-ututu nēzite ha; ma unu anughi, unu atọghi kwa nti-unu n'ala inu; 5 nāsi, Biko, latanu, onye ọ bula ya si n'uzọ ọjọ ya na n'ihe ọjọ nke omume nile unu lata, biri-kwa-nu n'elu ala nke Jehova nyere unu, nye kwa nna-unu-hà, site na mb͕e ebighi-ebi gara aga we rue mb͕e ebighi-ebi di n'iru: 6 unu ejeso-kwa-la chi ọzọ ifè ha na ikpọ isi ala nye ha, unu eji-kwa-la ọlu aka-unu kpasum iwe; M'gaghi-eme kwa unu ihe ọjọ. 7 Ma egeghm nti, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ka unu we were ọlu aka-unu kpasuem iwe, ime onwe-unu ihe ọjọ. 8 N'ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha ji si otú a: N'ihi na unu anughi okwum nile, 9 le, M'gaje iziga chiri ab͕uru nile nke Ugwu, (ọ̀ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ọ bu kwa Nebukadreza, bú eze Babilon, bú orùm, ka M'gēzigara ozi, M'gēme kwa ka ha bia imegide ala nka, na imegide ndi bi ya, na imegide mba nile ndia nọ ya buruburu; M'gēwezuga kwa ha ka ebibie ha, M'gēme kwa ha ka ha ghọ ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ, na nkpọnkpọ ebe di mb͕e ebighi-ebi. 10 Ọzọ, M'gēme ka olu obi-utọ, na olu ọṅù, na nwoke nālu nwunye ọhu, na olu nwanyi anālu ọhu, na olu nkume-igwe-nri, na ìhè oriọna, lanari ha n'iyì. 11 Ala nka nile gāghọ kwa nkpọnkpọ ebe na ihe-iju-anya; mba ǹdia gēfè kwa eze Babilon ọgu arọ na iri. 12 O gēru kwa, mb͕e ọgu arọ na iri ruzuru, na M'gēwere ajọ omume ha leta eze Babilon, leta kwa mba ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), leta kwa ala Kaldea; M'gēme kwa ya ka ọ ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu mb͕e ebighi-ebi. 13 M'gēme kwa ka okwum nile biakwasi ala ahu, bú okwu nke M'kwuworo megide ya, bú amuma nile edeworo n'akwukwọ a, nke Jeremaia buworo megide mba nile. 14 N'ihi na ọtutu mba na ndi-eze nke di uku gēme ka ha fè ha òfùfè, ọbuná ha onwe-ha: M'gākwughachi kwa dika omume nile ha si di, na dika ọlu nke aka-ha si di. 15 N'ihi na otú a ka Jehova, bu Chineke nke Israel, sirim: Nara iko manya nke ọnuma nka n'akam, me ka mba nile ṅua ya, bú ndi Mu onwem nēziga gi jekuru. 16 Ha gāṅu kwa, we ṅaghari, wi ara, n'ihi mma-agha ahu nke Mu onwem nēziga n'etiti ha. 17 M'we nara iko ahu n'aka Jehova, me ka mba nile ṅua, bú ndi Jehova zigaram jekuru: 18 bú Jerusalem, na obodo nile nke Juda, na ndi-eze-ya, na ndi-isi-ya, ime ha nkpọnkpọ ebe, na ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ, na ihe-nkọcha; dika o si dì ta; 19 Fero, bú eze Ijipt, na ndi-orù-ya, na ndi-isi-ya, na ndi-ya nile; 20 na ndi nile gwara, ọgwa na eze nile nke ala Uz, na eze nile nke ala ndi Filistia, na Ashkelon, na Geza, na Ekron, na ndi Ashdod fọduru; 21 na Edom, na Moab, na umu Amon; 22 na eze nile nke Taia, na eze nile nke Zaidon, na ndi-eze nke agwe-etiti nke di n'ofè oké osimiri; 23 Dedan, na Tima, na Buz, na ndi nile akọpuworo usọ isi-ha; 24 na eze nile nke Arebia, na eze nile nke ndi gwara ọgwa ndi bi n'ọzara; 25 na eze nile nke Zimri, na eze nile nke Ilam, na eze nile nke Midia; 26 na eze nile nke Ugwu, ma ndi bi nso ma ndi bi n'ebe di anya, onye na ibe-ya; na ala-eze nile nke uwa, nke di n'elu uwa: eze Shishak gāṅuso kwa ha. 27 I gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Ṅuanu, ṅubiga ókè, b͕ọ ab͕ọ, da, unu ebili-kwa-la ọzọ, n'ihi mma-agha ahu nke Mu onwem nēziga n'etiti unu. 28 Ọ gēru kwa, mb͕e ha gāju inara iko ahu n'aka-gi iṅu, na i gāsi ha, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Unu aghaghi iṅu. 29 N'ihi na, le, ọ bu n'obodo ahu nke akpọkwasiri aham ka Mu onwem nāmalite ime ihe ọjọ, ma unu onwe-unu, ùnu gābu ndi anāmaghi ikpe ma-ọli? Unu agaghi-abu ndi anāmaghi ikpe: n'ihi na mma-agha ka Mu onwem nākpọ ka ọ dakwasi ndi nile bi n'uwa; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta. 30 Ma gi onwe-gi gēburu ha amuma okwu nile ndia, si ha Jehova gēsi n'elu bib͕ọ, si kwa n'ebe-obibi-Ya di nsọ me ka olu-Ya da udà; Ọ gēbib͕osi ebe-ita-nri-Ya ike; nkpu dika ndi nāzọcha nkpuru-vine ka Ọ gēti imegide ndi nile bi n'uwa. 31 Nkpọtu nābiaru nsọtu uwa; n'ihi na Jehova nwere okwu-ikpé megide mba nile, Ya na anu-aru nile, bú madu, ganēje ikpe; ma ndi nēmebi iwu, Ọ'gēwere ha nye mma-agha; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 32 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Le, ihe ọjọ nāpu si n'otù mba jerue mba ọzo, agākpọte kwa oké ifufe site na nsọtu nile nke uwa. 33 Ndi Jehova b͕uru gādizu kwa n'ubọchi ahu site n'otù nsọtu uwa we rue nsọtu ọzọ nke uwa: agaghi-etiri ha aka n'obi, agaghi-achikọta kwa ha, agaghi-elì kwa ha; ǹsí-anu n'elu ala ka ha gāghọ. 34 Kwasienu ákwá ike, unu ndi-ọzùzù-aturu, ti-kwa-nu nkpu; turu-kwa-nu na ntu, unu ndi di ebube n'etiti ìgwè ewu na aturu: n'ihi na ubọchi-unu eruzuwo ka eb͕ue unu, M'gākpasa kwa unu, unu gāda kwa dika ihe anāchọsi ike. 35 Ebe-nb͕alaga alanariwo kwa ndi-ọzùzù-aturu, nb͕apu alanariwo ndi di ebube n'etiti ìgwè ewu na aturu. 36 Ge nti olu iti-nkpu nke ndi-ọzùzù-aturu, na nke ikwasi-ákwá-ike nke ndi di ebube n'etiti ìgwè ewu na aturu! n'ihi na Jehova nēbibi ebe-ita-nri-ha. 37 Emewo kwa ka ulo-obibi nile nke di n'udo dere du site n'iwe di ọku nke Jehova. 38 Ọ rapuwo okwu-ọhia-Ya, dika ọdum: n'ihi na ala-ha aghọwo ihe-iju-anya site n'idi-ọku nke mma-agha nēme ihe-ike, na site n'iwe-Ya di ọku.

Jeremaia 26

1 Na nmalite nke ọbubu-eze Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, ka okwu a sitere na Jehova, si, 2 Otú a ka Jehova siri: Guzo n'ogige ulo Jehova, gwa obodo nile nke Juda, bú ndi nābia ikpọ isi ala n'ulo Jehova, okwu nile nke M'nyere gi n'iwu igwa ha; agubìla otù nime ha. 3 Eleghi anya ha gānu, we lata, onye ọ bula o si n'uzọ ọjọ ya lata; ka M'we chègharia n'ihe ọjọ ahu nke Mu onwem nēchè ime ha n'ihi ihe ọjọ nke omume nile ha. 4 I gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova siri: Ọ buru na unu egeghm nti, ijehari n'iwum nke M'tiyeworo n'iru unu, 5 ige nti okwu nile nke ndi-orùm, bú ndi-amuma, ndi Mu onwem nēzitere unu, nēbili kwa n'isi-ututu nēzite ha, ma unu egeghi nti; 6 M'gēme kwa ka ulo a di ka Shailo, ọ bu kwa obodo a ka M'gēme ka ọ ghọrọ mba nile nke uwa ihe-nkọcha. 7 Ndi-nchu-àjà na ndi-amuma na ndi Israel nile we nu ka Jeremaia nēkwu okwu ndia n'ulo Jehova. 8 O rue, mb͕e Jeremaia kwubìri okwu nile nke Jehova nyere ya n'iwu igwa ndi Israel nile, na ndi-nchu-àjà na ndi-amuma na ndi Israel nile jidere ya, si, I ghaghi inwu anwu. 9 Gini mere i buworo amuma n'aha Jehova, si, Ulo a gādi ka Shailo, obodo a gābu kwa nkpọnkpọ ebe, ghara inwe onye-obibi? Ewe kpọkọta ndi Israel nile n'ebe Jeremaia nọ n'ulo Jehova. 10 Ndi-isi Juda we nu ihe ndia, ha we si n'ulo eze rigota n'ulo Jehova; ha we nọdu ala n'oghere ọnu-uzọ-ama ọhu nke ulo Jehova. 11 Ndi-nchu-àjà na ndi-amuma we gwa ndi-isi na ndi Israel nile okwu, si, Ikpé ọnwu kwesiri nwoke a; n'ihi na o buwo amuma megide obodo a, dika unu jiworo nti-unu nu. 12 Jeremaia we gwa ndi-isi nile, gwa ndi Israel nile, okwu, si, Jehova ziterem ibu amuma okwu nile nke unu nuworo megide ulo a na imegide obodo a. 13 Ma ub͕u a menu ka uzọ nile unu na omume nile unu di nma, ge-kwa-nu nti olu Jehova, bú Chineke-unu; Jehova gēchèghari kwa n'ihe ọjọ ahu nke O kwuworo megide unu. 14 Ma mu onwem, le, adim n'aka-unu: menum ka o si di nma na ka o si zie ezie n'anya-unu. 15 Nání, maranu nke-ọma na, ọ buru na unu eme ka m'nwua, ọbara nke nēmeghi ihe ọjọ ka unu onwe-unu nātukwasi n'aru unu, na n'aru obodo a, na n'aru ndi bi ya: n'ihi na n'ezi-okwu Jehova ezitewom ibiakute unu ikwu okwu ndia nile na nti-unu. 16 Ndi-isi na ndi Israel nile we si ndi-nchu-àjà, si kwa ndi-amuma, Ọ dighi ikpé ọnwu kwesiri nwoke a; n'ihi na ọ bu n'aha Jehova, bú Chineke-ayi, ka gwaworo ayi okwu. 17 Ufọdu nime ndi-okenye ala we bilie, gwa nkpọkọta ahu nile nke ndi Israel okwu, si, 18 Maika onye Moreshet nēburi amuma n'ubọchi Hezekaia, bú eze Juda; o we gwa ndi Juda nile okwu, si, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Agēji ploughi gwu Zaion dika ubi, Jerusalem gāghọ kwa obo-ihe obo-ihe, ugwu nke ulo ahu gādi kwa ka ebe di elu nke oké ọhia. 19 Hezekaia, bú eze Juda, na Juda nile, hà mere ya ka ọ nwua ma-ọli? ọ̀ tughi egwu Jehova, we chọ ka iru Jehova dajua, Jehova we chègharia n'ihe ọjọ ahu nke O kwururi megide ha? Ma ayi onwe-ayi nēme ihe ọjọ di uku megide nkpuru-obi-ayi. 20 Ọzọ kwa, otù nwoke di nke nēbu amuma n'aha Jehova, bú Uraia nwa Shemaia nke sitere na Kiriat-jearim; o we bue amuma megide obodo a, megide kwa ala nka, dika okwu nile nke Jeremaia si di: 21 Jehoiakim, bú eze, na ndi-dikei ya nile, na ndi-isi nile, we nu okwu-ya nile, eze we chọ ime ka ọ nwua; Uraia we nu ya, tua egwu, b͕alaga, we ba n'Ijipt: 22 Jehoiakim, bú eze, we ziga ndikom n'Ijipt, bú Elnetan nwa Akboa, na ndikom ufọdu so ya, ijeru Ijipt: 23 ha we me ka Uraia si n'Ijipt puta, ha we me ka ọ biakute eze, bú Jehoiakim; o we were mma-agha tibue ya, tubà ozu-ya n'ílì umu ndi Israel. 24 Ma otú ọ di, aka Ahaikam nwa Shefan di n'akuku Jeremaia, ka ha we ghara inye ya n'aka ndi Israel ime ka ọ nwua.

Jeremaia 27

1 Na nmalite ọbubu-eze Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, ka okwu a ruru Jeremaia nti site na Jehova, si, 2 Otú a ka Jehova sirim: Mere onwe-gi ab͕u di iche iche na nkpọrọ di iche iche, tukwasi ha n'olu-gi; 3 chiri ha zigara eze Edom, ziga-kwa-ra eze Moab, ziga-kwa-ra eze umu Amon, ziga-kwa-ra eze Taia, ziga-kwa-ra eze Zaidon, site n'aka ndi-ozi ndi nābiaru Jerusalem nābiakute Zedekaia, bú eze Juda; 4 nye ha iwu inye ndi-nwe-ha, si, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Otú a ka unu gāsi ndi-nwe-unu; 5 Mu onwem emewo uwa, na madu na anumanu nke di n'elu uwa, site n'ikem di uku, site kwa n'ogwe-akam nke eseteri eseti; ewerewokwam ya nye onye o ziri ezi n'anyam inye. 6 Ma ub͕u a Mu onwem enyewo ala nile ndia n'aka Nebukadneza, bú eze Babilon, bú orùm; ọzọ kwa, anu ọhia ka M'nyeworo ya ifè ya. 7 Mba nile gēfè kwa ya na nwa-ya na nwa nwa-ya òfùfè rue mb͕e mb͕e ala-ya biara: mb͕e ahu ya onwe-ya ka ọtutu mba na ndi-eze nke di uku gēme ka ọ fè ha òfùfè. 8 O gēru kwa, na mba ahu na ala-eze ahu nke nāgaghi-efè onye ahu, bú Nebukadneza eze Babilon, nke nāgaghi-etiye kwa olu-ya na yoke nke eze Babilon, M'gēji mma-agha, ji kwa oké unwu, ji kwa ajọ ọria nēfe efe, leta mba ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), rue mb͕e M'mere ka ha gwusia site n'aka-ya. 9 Ma unu onwe-unu, unu egela ndi-amuma-unu nti, ege-kwa-la ndi-unu nāju arusi ase, ege-kwa-la nrọ nile unu, ege-kwa-la ndi-unu nēji igwe-oji tu isi ọma ma-ọbu isi ọjọ, ege-kwa-la ndi-mb͕asi-unu, ndi nāgwa unu okwu, si, Unu agaghi-efe eze Babilon: 10 n'ihi na amuma ugha ka ndi ahu nēburu unu, ime ka unu si n'ala-unu je n'ebe di anya: ka M'we chupu kwa unu, unu ewe la n'iyì. 11 Ma mba ahu nke gēme ka olu-ya ba na yoke nke eze Babilon, nke gēfe kwa ya, M'gēkwe kwa ka mba ahu nọdu n'elu ala-ya, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); ha gālu kwa ya, biri kwa nime ya. 12 Ọ bu kwa Zedekaia, bú eze Juda, ka m'gwara okwu dika okwu nile ndia si di, si, Menu ka olu-unu ba na yoke nke eze Babilon, fè-kwa-nu ya na ndi-ya, we di ndu. 13 N'ìhi gini ka unu gānwu, gi onwe-gi na ndi-gi, site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe, dika Jehova kwuworo bayere mba ahu nke nāgaghi-efe eze Babilon? 14 Ma unu egela nti okwu nile nke ndi-amuma ndi nāgwa unu okwu, si, Unu agaghi-efé eze Babilon: n'ihi na amuma ugha ka ha nēburu unu. 15 N'ihi na eziteghm ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ma ha onwe-ha nēbu amuma ugha n'aham; ka M'we chupu unu, unu ewe la n'iyì, unu onwe-unu na ndi-amuma ndi nēburu unu amuma. 16 Ọ bu kwa ndi-nchu-àjà na ndi nka nile ka m'gwara okwu, si, Otú a ka Jehova siri: Unu egela nti okwu nile nke ndi-amuma-unu ndi nēburu unu amuma, si, Le, agaje isi na Babilon welata ihe nile nke ulo Jehova ub͕u a ngwa ngwa: n'ihi na amuma ugha ka ndi ahu nēburu unu. 17 Unu egela ha nti; fènu eze Babilon, we di ndu: n'ìhi gini ka obodo a gāghọ nkpọnkpọ ebe? 18 Ma ọ buru na ndi-amuma ka ha bu, ọ buru na okwa na okwu Jehova di ha n'ọnu, biko, ka ha riọ Jehova nke usu nile nke ndi-agha aririọ, ka ihe nile nke fọduru n'ulo Jehova, na n'ulo eze Juda, na nime Jerusalem, we ghara ibà na Babilon. 19 N'ihi na okwu di otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha kwuru bayere ogidi nile, baye-kwa-ra oké osimiri ahu, baye-kwa-ra ihe-ndọkwasi nile, baye-kwa-ra ihe fọduru, bú nke fọduru n'obodo a, 20 nke Nebukadneza, bú eze Babilon, nāchighi, mb͕e o mere ka Jekonaia nwa Jehoiakim, bú eze Juda, si na Jerusalem je biri na Babilon, ya na ndi Juda na Jerusalem nile amara aha-ha; 21 e, okwu di otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Irael, kwuru bayere ihe nile fọduru n'ulo Jehova na n'ulo eze Juda, na nime Jerusalem, si: 22 na Babilon ka agēbubà ha, ọ bu kwa n'ebe ahu ka ha gādi, rue ubọchi M'gēleta ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); mb͕e ahu ka M'gēbugota ha, bulata n'ebe a.

Jeremaia 28

1 O rue, n'arọ ahu, na nmalite ọbubu-eze Zedekaia, bú eze Juda, n'arọ nke-anọ, n'ọnwa nke-ise, na Hananaia nwa Azua, bú onye-amuma, nke sitere na Gibeon, gwaram okwu n'ulo Jehova, n'anya ndi-nchu-àjà na ndi Israel nile, si, 2 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, kwuru, si, Ab͕ajiwom yoke nke eze Babilon. 3 Tutu ogologo arọ abua eruzue Mu onwem ganēbulata nēbe a ihe nile nke ulo Jehova, nke Nebukadneza, bú eze Babilon, siri n'ebe a bupu, we bubà ha na Babilon: 4 ọzọ, Jekonaia nwa Jehoiakim, bú eze Juda, na ndi Juda nile emere ka ha je biri n'ala ọzọ, bú ndi bàworo na Babilon, ndia ka Mu onwem gaje ime ka ha lata n'ebe a, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): n'ihi na M'gab͕aji yoke nke eze Babilon. 5 Jeremaia, bú onye-amuma, we si Hananaia, bú onye-amuma, n'anya ndi-nchu-àjà, na n'anya ndi Israel nile ndi nēguzo n'ulo Jehova, 6 o we si, bú Jeremaia onye-amuma, Amen: Jehova me otú a: Jehova me ka okwu-gi nile guzosie ike, bú nke i buworo amuma, ime ka ihe nile nke ulo Jehova, na ndi nile emere ka je biri n'ala ọzọ, si na Babilon lata n'ebe a. 7 Nání, biko, nuru okwua nke mu onwem nēkwu na nti-gi abua, na na nti ndi nka nile: 8 Ndi-amuma ndi burum uzọ, ndi buru kwa gi uzọ, site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, ha we bue amuma megide ọtutu ala, megide kwa ala-eze uku di iche iche, bayere agha, baye-kwa-ra ihe ọjọ, baye-kwa-ra ajọ ọria nēfe efe. 9 Onye-amuma nke nēbu amuma bayere udo, mb͕e okwu onye-amuma ahu gērè, agāmara onye-amuma ahu, na Jehova ezitewo ya n'ezie. 10 Hananaia, bú onye-amuma, we kopu nkpọrọ ahu n'olu Jeremaia, bú onye-amuma, we b͕ajie ya. 11 Hananaia we kwue okwu n'anya ndi Israel nile, si, Otú a ka Jehova siri: Ọbuná otú a ka M'gāb͕ajipu yoke nke Nebukadneza, bú eze Babilon, n'olu mba nile tutu ogologo arọ abua eruzue. Jeremaia, bú onye-amuma, we la. 12 Okwu Jehova we rue Jeremaia nti, mb͕e Hananaia, bú onye-amuma, b͕ajipusiri nkpọrọ n'olu Jeremaia, bú onye-amuma, si, 13 Je, gwa Hananaia okwu, si, Otú a ka Jehova siri: Nkpọrọ osisi ka i b͕ajiworo; ma i mewo nkpọrọ ígwè n'ọnọdu ha. 14 N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Yoke nke ígwè ka M'tukwasiworo n'olu mba nile ndia, ka ha we fè Nebukadneza, bú eze Babilon; ha gēfè kwa ya: ọzọ, anu ọhia ka M'nyeworo ya. 15 Jeremaia, bú onye-amuma, we si Hananaia, bú onye-amuma, Biko, nuru, Hananaia; Jehova eziteghi gi; ma gi onwe-gi emewo ka ndi nka tukwasi okwu-ugha obi. 16 N'ihi nka ka Jehova ji si otú a, Le, M'gaje isi n'elu uwa zilaga gi: n'arọ a ka gi onwe-gi gānwu, n'ihi na okwu nwezuga ka i kwuworo megide Jehova. 17 Hananaia, bú onye-amuma, we nwua n'arọ ahu n'ọnwa nke-asa.

Jeremaia 29

1 Ma ndia bu okwu nke akwukwọ ahu nke Jeremaia, bú onye-amuma, si na Jerusalem zigara ndi-okenye fọduru nime ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, nke o ziga-kwa-ra ndi-nchu-àjà, ziga-kwa-ra ndi-amuma, ziga-kwa-ra ndi Israel nile, ndi Nebukadneza mere ka ha si na Jerusalem je biri na Babilon: 2 (mb͕e Jekonaia, bú eze, na eze-nwanyi, na ndi-onozi, na ndi-isi Juda na Jerusalem, na ndi-ọ̀kà, na ndi-uzú, pusiri na Jerusalem; ) 3 site n'aka Elasa nwa Shefan, na Gemaraia nwa Hilkaia, (ndi Zedekaia, bú eze Juda, zigara Nebukadneza, bú eze Babilon, rue Babilon, ) si, 4 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri ndi nile emere ka ha je biri n'ala ọzọ, bú ndi M'meworo ka eme ka ha si na Jerusalem je biri na Babilon: 5 Wuenu ulo, biri; kukwa-nu ihe n'ubi ab͕ara ogige, rie nkpuru-ha; 6 luanu nwunye, mua umu-ndikom na umu-ndinyom; lu-kwa-ranu umu-unu ndikom nwunye, lu-kwa-ranu umu-unu ndinyom di, ka ha we mua umu-ndikom na umu-ndinyom; ba-kwa-nu uba n'ebe ahu, ghara ibilata. 7 Chọ-kwa-nu udo nke obodo ahu nke M'meworo ka eme ka unu je biri n'ebe ahu, kpe-kwa-ranu Jehova ekpere bayere ya: n'ihi na n'udo-ya ka udo gādiri unu. 8 N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Unu ekwela ka ndi-amuma-unu ndi nọ n'etiti unu, na ndi-unu ndi nāju arusi ase, rafue unu, unu ege-kwa-la nti nrọ nile unu nke unu onwe-unu nēme ka arọ ha. 9 N'ihi na amuma ugha ka ndi ahu nēburu unu n'aham: eziteghm ha; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 10 N'ihi na otú a ka Jehova siri, Mb͕e ọgu arọ atọ na iri ruzuru nye Babilon, M'gēleta unu, me ka ezi okwum ahu guzosiere unu ike, n'ime ka unu lata n'ebe a. 11 N'ihi na Mu onwem mara èchìchè nile nke Mu onwem nēchè bayere unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), èchìchè nke udo, ọ bughi nke ihe ọjọ, inye unu ọdi-n'iru na ntukwasi-obi. 12 Unu gākpọkukwam, je kperem ekpere, M'gēge kwa unu nti. 13 Unu gāchọsikwam ike, we chọtam, mb͕e unu ji obi nile unu achọm. 14 M'gēkwe kwa ka unu chọtam, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gēme kwa ka ndi-unu adọtara n'agha lata, M'gēsi kwa na mba nile, na n'ebe nile M'chugaworo unu, chikọta unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); M'gēme kwa ka unu lata n'ebe ahu nke M'mere ka unu si n'ebe ahu je biri n'ala ọzọ. 15 N'ihi na unu asiwo, Jehova emewo ka ndi-amuma biliere ayi nime Babilon. 16 N'ihi na okwu di otú a ka Jehova kwuru bayere eze ahu nke nānọkwasi n'oche-eze Devid, baye-kwa-ra ndi nka nile nke bi n'obodo a, bú umu-nne-unu ndi nēsoghi unu pua ije n'ala ọzọ ebe emere ka unu je biri; 17 otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Le, M'gaje iziga n'etiti ha mma-agha, na oké unwu, na ajọ ọria nēfe efe, M'gēme kwa ha ka ha di ka fig jọb͕uru onwe-ha, nke anāgaghi-eri eri, site n'ijọ-njọ-ha. 18 M'gēji kwa mma-agha, ji kwa oké unwu, ji kwa ọria nēfe efe, chuso ha, M'gēwere kwa ha nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari, ibu ihe-ọb͕ub͕a-iyi, na ibu ihe-iju-anya, na ibu ihe-ima-ọsọ, na ibu ihe-ita-uta, n'etiti mba nile ebe M'chugaworo ha: 19 n'ihi na ha egeghi nti okwum nile, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), nke M'zigara ha ndi-orùm, bú ndi-amuma, igwa ha, nēbili n'isi-ututu nēziga ha; ma unu egeghi nti; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 20 Ma unu onwe-unu, nurunu okwu Jehova, unu ndi nile emere ka unu je biri n'ala ọzọ, ndi M'zigara si na Jerusalem rue Babilon. 21 Okwu di otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, kwuru bayere Ehab nwa Kolaia, baye-kwa-ra Zedekaia nwa Maaseia, ndi nēburu unu amuma ugha n'aham, si: Le, M'gaje inye ha n'aka Nebukadreza, bú eze Babilon; o gētib͕u kwa ha n'anya-unu; 22 agēsite kwa na ha bulie nkọcha, nke ndi Juda nile emere ka ha je biri n'ala ọzọ ndi nọ na Babilon gēji kọcha, si, Jehova me gi ka i di ka Zedekaia na dika Ehab, ndi eze Babilon rub͕uru n'ọku: 23 n'ihi na ha emewo ihe-nzuzu n'Israel, we kwa nwunye ndikom-ibe-ha iko, kwu kwa okwu n'aham n'ugha, bú nke M'nēnyeghi ha n'iwu; ma Mu onwem bu onye mara, na onye-àmà; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 24 Ọzọ, okwu bayere Shemaia, bú onye-Nehelamait, ka i gēkwu, si, 25 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, kwuru, si, N'ihi na gi onwe-gi ezigaworo ndi nka nile ndi bi na Jerusalem, ziga-kwa-ra Zefanaia nwa Maaseia, bú onye-nchu-àjà, ziga-kwa-ra ndi-nchu-àjà nile, akwukwọ n'aha-gi, si, 26 Jehova emewo gi onye-nchu-àjà n'ọnọdu Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, ka ndi-nlekọta we di n'ulo Jehova, imeso onye ọ bula nāwi ara, nke nēme kwa onwe-ya onye-amuma, ka i we tiye ya n'ọtọsi na nime nkpọrọ olu. 27 Ma ub͕u a, n'ìhi gini ka i nābasighi Jeremaia onye Anatot nba ike, onye nēme onwe-ya onye-amuma n'ebe unu nọ, 28 n'ihi na o ziteworo ayi ozi na Babilon, si, Mb͕e unu gēbi n'ala ọzọ di anya: wuenu ulo, biri; kuanu ihe n'ubi ab͕ara ogige, rie nkpuru-ha? 29 Zefanaia, bú onye-nchu-àjà, we gua akwukwọ a na nti Jeremaia, bú onye-amuma. 30 Okwu Jehova we rue Jeremaia nti, si, 31 Zigara ndi nile emere ka ha je biri n'ala ọzọ, si, Okwu di otú a ka Jehova kwuru bayere Shemaia onye-Nehelamait, si: N'ihi na Shemaia ebuworo unu amuma, ma Mu onwem eziteghi ya, o we me ka unu tukwasi okwu-ugha obi; 32 N'ihi nka ka Jehova ji si otú a, Le, M'gaje iji nmehie Shemaia onye-Nehelamait leta ya, leta kwa nkpuru-ya; ọ gaghi-enwe nwoke ọ bula nēbi n'etiti ndi nka, ọ gaghi-elekwasi kwa ezi ihe ahu anya, bú nke Mu onwem nēmere ndim, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): n'ihi na okwu nwezuga ka o kwuworo megide Jehova.

Jeremaia 30

1 Okwu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, si, 2 Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, kwuru, si, Dere onwe-gi n'akwukwọ okwu nile nke M'gwaworo gi. 3 N'ihi na, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gēme ka ndim lata, bú Israel na Juda, ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); M'gēme kwa ka ha lata n'ala ahu nke M'nyere ndi bu nna-ha, ha gēnweta kwa ya. 4 Ma ndia bu okwu nke Jehova kwuru bayere Israel, baye-kwa-ra Juda. 5 N'ihi na otú a ka Jehova siri: Olu nke ọma-jijiji ka ayi nuworo; egwu di, ma udo adighi. 6 Biko, juanu, hu ma ime nēme nwoke: gini mere M'huworo ndikom nile n'otù ka aka-ha di n'úkwù-ha, dika nwanyi ime nēme, iru nile ab͕anwewo kwa we di ka nke ozu? 7 Éwù! n'ihi na ub͕ochi ahu di uku, ọ dighi kwa ubọchi nke di ka ya: ọbuná mb͕e ahuhu ka ọ buru Jekob; ma agēsi nime ya zọputa ya. 8 Ọ gēru kwa n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), na M'gāb͕ajipu yoke-ya n'olu-gi, ọ bu kwa ab͕u-gi nile ka M'gētibì; ndi ala ọzọ agaghi-eme kwa ka ọ fè ha òfùfè ọzọ: 9 ma ha gēfè Jehova, bú Chineke-ha, na Devid, bú eze-ha, onye M'gēme ka o biliere ha. 10 Ma gi onwe-gi, atula egwu, gi orùm, bú Jekob, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); atu-kwa-la ujọ, gi Israel: n'ihi na, le, M'gaje izọputa gi n'ebe di anya, zọputa kwa nkpuru-gi n'ala ọzọ ebe emere ka ha je biri; Jekob gālata kwa, nọ jū n'aru bū, ọ dighi kwa onye ganēme ka ọ ma jijiji. 11 N'ihi na gi ka M'nọyere, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), izọputa gi: n'ihi na M'gēme ka mba nile gwusia, bú ebe M'chusaworo gi, ma otú ọ di, gi ka M'nāgaghi-eme ka i gwusia: ma M'gādọ gi aka na nti n'ikpé, M'gaghi-asi kwa na i bu onye ikpe nāmaghi ma-ọli. 12 N'ihi na otú a ka Jehova siri, Ihe nādighi ngwọta ka nb͕aji aka na ukwu gi bu, ọnyá-gi etiputara etiputa jọrọ njọ. 13 Ọ dighi onye nēkpe ọnu-gi: ọ dighi ọgwu ntechi i nwere. 14 Ndi nile ndi nāhu gi n'anya echezọwo gi; ha adighi-achọ gi: n'ihi na otiti nke onye-iro, bú idọ-aka-na-nti nke onye nēnweghi obi-ebere, ka M'wereworo tie gi; n'ihi iba-uba nke ajọ omume-gi, n'ihi na nmehie-gi nile nwere ume. 15 Gini mere i ji ti nkpu bayere nb͕aji aka na ukwu gi? ihe nādighi ngwọta ka ihe-nb͕u-gi bu: n'ihi iba-uba nke ajọ omume-gi, n'ihi na nmehie-gi nile nwere ume, ka M'meworo gi ihe ndia. 16 N'ihi nka agēripia ndi nile nēripia gi; ọzọ, ndi nile ndi nākpab͕u gi, ha nile, na ndọta-n'agha ka ha gāla; ndi nāpunara gi ihe gāghọ ihe apunaraworo n'aka madu, ọ bu kwa ndi nile nke nāluta ihe-gi n'agha ka M'gēnye ka ha ghọ ihe-nluta-n'agha. 17 N'ihi na M'gēme ka anu-aru ọhu puchie n'aru gi, M'gāgwọpu kwa gi n'ọnyá-gi nile etiputara, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); n'ihi na Nwanyi achupuru achupu ka ha kpọworo gi, si, Zaion ka ọ bu, ọ dighi onye nāchọ ya. 18 Otú a ka Jehova siri: Le, M'gaje ime ka ulo-ikwū nile nke Jekob adọtara n'agha lata, ọ bu kwa n'aru ebe-obidi-ya nile ka M'gēnwe obi-ebere; agēwu kwa obodo n'elu obo-ya, agēbi kwa n'ulo-elu-ya dika esiri ebi ya. 19 Ekele na olu nke ndi-ngwuri gēsi kwa nime ha puta: M'gēme kwa ka ha ba uba, ha agaghi-adi kwa ole-na-ole; M'gēme kwa ka ha di nsọpuru ha agaghi-adi kwa ntà. 20 Umu-ha gādi kwa ka ha si di na mb͕e ochie, nzukọ-ha gēguzosi kwa ike n'irum, M'gēji kwa nmehie nke ndi nile nēmeb͕u ya leta ha. 21 Ọzọ, onye-ebube nke Jekob gābu onye sitere na ya, onye nāchi ya gēsi kwa n'etiti ya puta; M'gēme kwa ka ọ biarue nso, o we biakutem nso: n'ihi na ònye ka onye a bu nke nọworo obi-ya mbé ibiakutem nso? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 22 Unu gābu-kwa-ram otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra unu Chineke. 23 Le, oké ifufe nke Jehova, bú ọnuma-Ya, apuwo, ọ bu oké ifufe nke nēfechapu efechapu: n'isi ndi nēmebi iwu ka ọ gēfekwasi si-ike. 24 Iwe di ọku nke Jehova agaghi-alaghachi azu, rue mb͕e O mesiri, ru kwa mb͕e O mesiri ka nzube nile nke obi-Ya guzosie ike: na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia ka unu gāghọta ya.

Jeremaia 31

1 Na mb͕e ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gāburu ab͕uru nile nke Israel Chineke, ndi ahu gābu-kwa-ram otù ndi. 2 Otú a ka Jehova siri, Ndi siri na mma-agha fọdu hutara amara n'ọzara; mb͕e M'jere ime ka o nwe ọnọdu, bú Israel. 3 Site n'ebe di anya ka Jehova mere ka m'hu Ya, si, Ọ bu ihu-n'anya nke di mb͕e ebighi-ebi ka M'jiworo hu gi n'anya: n'ihi nka ka M'meworo ka ebere digidere gi. 4 M'gēwu kwa gi ọzọ dika ulo, ewe wu gi, gi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú Israel: agēji kwa egwú-otiti-gi nile chọ gi nma ọzọ, i gēso kwa otite-egwú nke ndi nēgwuri egwú pua. 5 I gāku kwa ubi-vine ọzọ n'elu ugwu nile nke Sameria: ndi nāku vine gāku, me ka ha pua na nsọ anāsọ ha. 6 N'ihi na otù ubọchi gādi mb͕e ndi-nche ndi nọ n'ugwu Efraim gākpọ, si, Bilienu, ka ayi rigorue Zaion jekuru Jehova, bú Chineke-ayi. 7 N'ihi na otú a ka Jehova siri, Werenu ọṅù tiere Jekob nkpu ọṅù, tisi-kwa-nu nkpu ike n'isi mba nile: menu ka anuru ya, tonu, si-kwa-nu, Jehova, zọputa ndi-Gi, bú Israel fọduru. 8 Le, M'gaje ime ka ha si n'ala Ugwu bia, M'gāchikọputa kwa ha na nsọtu nile nke uwa, n'etiti ha ka onye-ìsì na onye-ngwurọ na nwanyi di ime na nwanyi ime nēme gānọ n'otù: na nkpọkọta uku ka ha gālata n'ebe a. 9 N'ikwa-ákwá ka ha gābia, ọ bu kwa n'aririọ-amara nile ka M'gēduru ha: M'gēme ka ha jerue iyi di iche iche juputara na miri, n'uzọ ziri ezi, nke ha nāgaghi-asu ngọngọ nime ya: n'ihi na aghọworom Israel nna, ma Efraim, ọkparam ka ọ bu. 10 Nurunu okwu Jehova, unu mba nile, gosi-kwa-nu ya n'agwe-etiti nile di n'ebe di anya; si-kwa-nu, Onye nēfesa Israel gāchikọta ya, debe kwa ya, dika onye-ọzùzù-aturu si emere ìgwè aturu-ya. 11 N'ihi na Jehova ab͕aputawo Jekob, me ka ọ pua n'aka onye dikariri ya ike nwere onwe-ya. 12 Ha gābia kwa, tie nkpu ọṅù n'ebe di elu nke Zaion, rùba dika osimiri rue ezi ihe Jehova, rue ọka, ru kwa manya-vine, ru kwa manu, ru kwa umu ìgwè ewu na aturu na nke ìgwè ehi: nkpuru-obi-ha gādi kwa ka ubi ab͕ara ogige nke dere miri nke-ọma; ha agaghi-eru kwa újú ọzọ ma-ọli. 13 Mb͕e ahu ka nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke gāṅuri ọṅu n'otite-egwú, umu-okorọbia na ndi-okenye gāṅuri kwa ọṅu n'otù: n'ihi na M'gāb͕anwe oruru-újú-ha n'obi-utọ, kasi kwa ha obi, me ka ha si na nwuta-ha ṅuria ọṅu. 14 M'gēme kwa ka afọ abuba jubiga nkpuru-obi ndi-nchu-àjà ókè, afọ ezi ihem gēju kwa ndim; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 15 Otú a ka Jehova siri: Olu nime Rema ka anuru, bú abù-ákwá, na ikwa-ákwá nēlu ilu nke-uku, Rechel nākwara umu-ya ákwá; ọ juwo na agaghi-akasi ya obi bayere umu-ya, n'ihi na ha adighi. 16 Otú a ka Jehova siri: Jide olu-gi ka ọ ghara ikwa ákwá, jide kwa anya-gi abua ka ha ghara ib͕a anya-miri: n'ihi na ugwọ-ọlu di agākwu gi n'ọlu-gi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): ha gēsi kwa n'ala onye-iro lata. 17 Olile-anya di-kwa-ra ọdi-n'iru-gi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); umu-gi gālata kwa n'ókè-ala-ha. 18 Anuchasiwom ka Efraim nēgosi onwe-ya ebere o nwere n'aru onwe-ya otú a, si, I dọwom aka na nti, ewe dọm aka na nti, dika nwa-ehi nke anēmeghi ka ọ muta ọlu-ya: chighariam, m'we chigharia onwem; n'ihi na Gi onwe-gi bu Jehova, bú Chinekem. 19 N'ezie mb͕e m'chigharisiri, m'we chegharia: ọzọ, mb͕e emesiri ka m'mara, m'we tie aka n'apata-ukwum; ihere merem, ewe tiyekwam n'ọnọdu-ihere, n'ihi na eburum ita-uta nke mb͕e m'di na nwata. 20 Efraim, ọ̀ bu nwa-nwoke di oké ọnu-ahia M'nwere? ọ̀ bu nwa nātọm utọ nke-uku? n'ihi na ka mb͕e ra M'nēkwu okwu megide ya, anamecheta ya nke-ọma rue ub͕u a: n'ihi nka ngiri-afọm adaworo ya udà; aghaghm inwe obi-ebere n'aru ya ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 21 Me ka ogidi di iche iche iri uzọ ama guzoro onwe-gi ọtọ, doro onwe-gi ide di iche iche iri uzọ ama: tukwasi obi-gi n'uzọ ahu atuliri atuli, bú uzọ nke i jere ije nime ya: lata, gi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú israel, lata n'obodo-gi ndia. 22 Rùe ole mb͕e ka i ganēje iru na azu, gi ada nke nādaghachi azu? n'ihi na Jehova ekèwo ihe -ohu n'uwa, Nwanyi gānọ nwoke buruburu. 23 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Ha gēkwu kwa okwu a ọzọ n'ala Juda, na n'obodo-ya nile, mb͕e m'gēme ka ndi-ya adọtara n. agha lata, si: Jehova gọzie gi, gi ebe-obibi nke ezi omume, gi ugwu nke idi-nsọ. 24 Juda na obodo-ya nile gēbikọ nime ya n'otù; ndi-ubi, na ndi nāchiri ìgwè aturu-ha bulie ije. 25 N'ihi na emewom ka afọ jubiga nkpuru-obi nāda #mbà ókè, ọ bu kwa nkpuru-obi ọ bula nke nēru újú ka M'juworo. 26 Mb͕e nka gasiri m'we teta, we hu; uram we tọm utọ. 27 Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gagha nkpuru madu na nkpuru anumanu n'ulo Israel na n'ulo Juda. 28 Ọ gēru kwa na, dika M'muworo anya n'aru ha iropu na ikwada, na itikpọ na ime ka ala n'iyì, na imejọ; otú a ka M'gāmu anya n'aru ha iwu ulo na iku ihe n'ubi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 29 N'ubọchi ahu ha agaghi-asi kwa ọzọ, Nna-ayi-hà eriwo nkpuru-vine nāchaghi acha, ezé umu-ha we nēru izìzì. 30 Kama onye ọ bula gānwu n'ihi ajọ omume nke aka ya: madu ọ bula nke nēri nkpuru-vine nāchaghi acha, ezé-ya ganēru izìzì. 31 Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e Mu na ulo Israel na ulo Juda gāb͕a ọb͕ub͕a-ndu ọhu: 32 ọ bughi dika ọb͕ub͕a-ndu ahu si di nke Mu na ndi bu nna-ha b͕ara n'ubọchi M'jidere ha n'aka ime ka ha si n'ala Ijipt puta; n'ihi na ha onwe-ha mebiri ọb͕ub͕a-ndum ahu, ọ bu ezie na Mu onwem bu di nwe ha; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 33 N'ihi na nka bu ọb͕ub͕a-ndu nke Mu na ulo Israel gāb͕a mb͕e ubọchi nile ahu gasiri, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); M'gētiye iwum n'ime-ha, ọ bu kwa n'obi-ha ka M'gēdekwasi ya dika n'akwukwọ; M'gābu-kwa-ra ha Chineke, ha onwe-ha gābu-kwa-ram otù ndi: 34 ha agaghi-eme kwa onwe-ha ka ha muta ọzọ, onye ọ bula o me ka onye-ab͕ata-obi-ya muta, onye ọ bula o me kwa ka nwa-nne-ya muta, si, Maranu Jehova: n'ihi na ha nile gāmara Mu onwem, site n'onye dikarisiri ntà nime ha we rue onye dikarisiri uku nime ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): n'ihi na M'gāb͕aghara ajọ omume-ha, M'gaghi-echeta kwa nmehie-ha ọzọ. 35 Otú a ka Jehova siri, bú Onye nēnye anyanwu ka ọ buru ìhè n'ehihie, na ukpuru nile nke ọnwa na nke kpakpando nile ka ha buru ìhè n'abali, Onye nēme ka oké osimiri dere du mb͕e nmali-miri-ya nile nēbib͕ọ; Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya: 36 Ọ buru na ukpuru ndia apua n'irum, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), nkpuru Israel gākwusi kwa n'ibu mba n'irum ubọchi nile. 37 Otú a ka Jehova siri: Ọ buru na agātù elu-igwe nke di n'elu, ọ buru kwa na egwuputa ntọ-ala nile nke uwa nke di n'okpuru, Mu onwem gāju kwa nkpuru nile nke Israel n'ihi ihe nile nke ha meworo; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 38 Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e agēwuru Jehova obodo a site n'ulo-elu nke Hananel rue ọnu-uzọ-ama nke nkuku. 39 Eriri ọtùtù gāpu kwa ọzọ na ncherita-iru ya, rue ugwu ntà Gareb, ọ gāga kwa buruburu rue Goa. 40 Ndagwurugwu ahu nile nke ozu, na nke ntu, na ọzara nile rue miri-iyi Kidron, rue nkuku ọnu-uzọ-ama inyinya n'akuku ọwuwa-anyanwu, gābu ihe nsọ Jehova nwere; agaghi-eropu ya, agaghi-etikpọ kwa ya ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi.

Jeremaia 32

1 Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova n'arọ nke-iri nke Zedekaia, bú eze Juda, nke bu arọ nke-iri-na-asatọ nke Nbukadreza. 2 Ma mb͕e ahu usu-ndi-agha eze Babilon nānọchigide Jerusalem n'agha: ma Jeremaia, bú onye-amuma, nọ ka onye eb͕ochibidoworo n'ogige ulo-nche, nke di n'ulo eze Juda. 3 N'ihi na Zedekaia, bú eze Juda, b͕ochibidoro ya-ri, si, Gini mere gi onwe-gi ji ebu amuma, si, Otú a ka Jehova siri, Le, M'gaje inye obodo a n'aka eze Babilon, ọ gēwere kwa ya; 4 ma Zedekaia, bú eze Juda, agaghi-ewepuga onwe-ya n'aka ndi Kaldea, kama aghaghi inye ya n'aka eze Babilon, ha gēkwurita kwa ọnu na ọnu, anya-ya gāhu kwa anya-ya: 5 ọ bu kwa Babilon ka ọ gēme ka Zedekaia jerue, ọ bu kwa n'ebe ahu ka ọ gānọ rue mb͕e M'gēleta ya, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): mb͕e unu gēbuso ndi Kaldea agha, ọ gaghi-agara unu nke-ọma? 6 Jeremaia we si, Okwu Jehova rurum nti, si, 7 Le, Hanamel nwa Shalum, bú nwa-nne nna-gi, gābiakute gi, si, Zutara onwe-gi ubim nke di n'Anatot: n'ihi na gi ka nb͕aputa ruru izuru ya. 8 Hanamel nwa nwa-nne nnam we biakutem, dika okwu Jehova si di, rue ogige ulo-nche, sim, Biko, zuru ubim nke di n'Anatot, nke di n'ala Benjamin: n'ihi na gi ka nnweta-ya ruru, ọ bu kwa gi nwe nb͕aputa-ya; zutara onwe-gi. M'we mara na okwu Jehova ka nka bu. 9 M'we zuru ubi ahu n'aka Hanamel nwa nwa-nne nnam, bú nke di n'Anatot, m'we tùara ya ego-ya, bú shekel iri na asa nke ọla-ọcha. 10 M'we de aham n'akwukwọ ala ahu, ka ya akàrà, kpọ ndi-àmà, tùara ya ego ahu n'ihe-ọtùtù. 11 M'we were akwukwọ nzuta-ala ahu, ma nke akara akàrà, nke ihe-ya enyere n'iwu na ukpuru-ya nile di nime ya, ma nke ghere oghe: 12 m'we were akwukwọ nzuta-ala ahu nye Beruk nwa Neraia, nwa Mahseia, n'anya Hanamel nwa nwa-nne nnam, na n'anya ndi-àmà ndi deworo aha-ha n'akwukwọ nzuta-ala ahu, n'anya ndi-Ju nile ndi nānọdu ala n'ogige ulo-nche ahu. 13 M'we nye Beruk iwu n'anya ha, si, 14 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Chiri akwukwọ ndia, bú akwukwọ nzuta-ala nka, ma nke akara akàrà, ma akwukwọ a nke ghere oghe, tiye ha n'ite urọ; ka ha we digide ọtutu ubọchi. 15 N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Agāzu kwa ulo na ubi na ubi-vine ọzọ n'ala nka. 16 M'we kpere Jehova ekpere, mb͕e m'nyesiri Beruk nwa Neraia akwukwọ nzuta-ala, ahu, si, 17 Ewo, Onye-nwe-ayi Jehova! le, Gi onwe-gi emewo elu-igwe na uwa site n'ike uku Gi na site n'ogwe-aka-Gi eseteri eseti: ọ dighi ihe ọ bula kariri Gi ime: 18 Gi onye nēmere nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri ọtutu ub͕ò ebere, Onye nākwughachi ajọ omume nke ndi bu nna n'obi umu-ha gēsota ha n'azu: Chineke uku, nke bu dike, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya: 19 I di uku na ndum-ọdu, di kwa ike n'omume: Onye anya-Gi ghere oghe ilekwasi uzọ nile nke umu madu; inye onye ọ bula dika uzọ-ya nile si di, na dika nkpuru omume-ya nile si di: 20 Onye doro ihe-iriba-ama di iche iche na ihe-ebube di iche iche n'ala Ijipt, rue ta, ma n'etiti Israel ma n'etiti madu ọzọ; I we mere Onwe-gi aha, dika ta; 21 I we ji ihe-iriba-ama di iche iche, ji kwa ihe-ebude di iche iche, ji kwa aka di ike, ji kwa ogwe-aka setiri eseti, ji kwa egwu di uku, me ka ndi-Gi, bú Israel, si n'ala Ijipt puta; 22 I we nye ha ala nka, nke I ṅuru ndi bu nna-ha iyi inye ha, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù na ya; 23 ha we bata, nweta ya; ma ha egeghi nti olu-Gi, ọ bu kwa n'iwu-Gi ka ha nējegharighi; n'ihe nile nke I nyere ha n'iwu ime ọ dighi nke ha meworo: I we me ka ihe ọjọ a nile dakwasi ha: 24 Le, obo-ihe ndia atuliri atuli, ha abiaruwo obodo a iwere ya; enyewo kwa obodo a n'aka ndi Kaldea ndi nēbuso ya agha, n'ihi mma-agha, na oké unwu, na ajọ ọria nēfe efe: ihe I kwuworo erèwo kwa; ma, le, I nāhu ya. 25 Ma Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi Jehova, asiwom, Were ego zutara onwe-gi ubi ahu, kpọ kwa ndi-àmà; ma enyewo obodo a n'aka ndi Kaldea. 26 Okwu Jehova we rue Jeremaia nti, si, 27 Le, Mu onwem bu Jehova, Chineke nke anu-aru nile, bú madu: ọ̀ di ihe ọ bula karirim ime? 28 N'ihi nka ka Jehova ji si otú a: Le, M'gaje inye obodo a n'aka ndi Kaldea, na n'aka Nebukadreza, bú eze Babilon, ọ gēwere kwa ya: 29 ndi Kaldea, bú ndi nēbuso obodo a agha, gābia kwa suye obodo a ọku, sure ya na ulo nile, nke ha sureworo ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ nye Beal n'elu-ha, wusi-kwa-ra chi ọzọ di iche iche àjà-ihe-ọṅuṅu, ka ha we kpasuem iwe. 30 N'ihi na umu Israel na umu Juda aghọwo nání ndi nēme ihe jọrọ njọ n'anyam abua site na mb͕e ha di na nwata: n'ihi na umu Israel bu nání ndi ji ọlu aka-ha akpasum iwe; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 31 N'ihi na ihe ikpasu iwem na ikpasu ọnumam ka obodo a buruworom site n'ubọchi mb͕e ha wuru ya we rue ta; ka M'we si n'irum wezuga ya: 32 n'ihi ihe ọjọ ahu nile nke umu Israel na nke umu Juda, nke ha meworo ikpasum iwe, ha onwe-ha, na ndi-eze-ha, na ndi-isi-ha, na ndi-nchu-àjà-ha, na ndi-amuma-ha, na ndi Juda, na ndi bi na Jerusalem. 33 Ha we b͕akutam azu, ha echeghm iru: anameme kwa ka ha muta ihe, nēbili n'isi-ututu nēme ka ha muta, ma ha adighi-anu inara idọ́-aka-na-nti. 34 Ha we do ihe-árú nile ha n'ulo ahu nke akpọkwasiri aham, imeru ya. 35 Ha we wue ebe nile di elu nke Beal, nke di na ndagwurugwu nwa Hinom, ime ka umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom si n'ọku gabigarue Molek; bú ihe nke M'nēnyeghi ha n'iwu, ọ bataghi kwa n'obim, ka ha we me ihe-árú a; ime ka Juda mehie. 36 Ma ub͕u a n'ihi nka ka Jehova, bú Chineke nke Israel, ji kwue okwu di otú a bayere obodo a, nke unu onwe-unu nāsi, Enyewo ya n'aka eze Babilon site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe: 37 si, Le, M'gaje ichikọputa ha n'ala nile, ebe M'chugaworo ha n'iwem, na n'ọnumam, na n'oké iwe di uku; M'gēme kwa ka ha lata n'ebe a, me kwa ka ha biri na ntukwasi-obi: 38 ha gābu-kwa-ram otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra ha Chineke: 39 M'gēnye kwa ha otù obi na otù uzọ, itu egwu Mu onwem ubọchi nile; ka o we diri ha, di-kwa-ra umu-ha ndi gānọchi ha, nma: 40 Mu na ha gāb͕a kwa ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi, na M'gaghi-esi n'iso ha ime ha nma laghachi azu; ma egwum ka M'gētiye n'obi-ha, ka ha we ghara isi n'ebe M'nọ wezuga onwe-ha. 41 Obi gātọkwam utọ n'aru ha ime ha nma, M'gēji kwa obim nile, ji kwa nkpuru-obim nile, kua ha n'ala nka n'ezie dika osisi. 42 N'ihi na otú a ka Jehova siri: Dika M'meworo ka ihe ọjọ uku a nile biakute ndi nka, otú a ka Mu onwem nēme ka ezi ihe ahu nile biakwasi ha, bú nke Mu onwem nēkwu bayere ha. 43 Agāzú kwa ọhia n'ala nka, nke unu onwe-unu nāsi, Nkpọnkpọ ebe ka ọ bu, nke ọ nādighi madu ma-ọbu anumanu bi nime ya; enyewo ya n'aka ndi Kaldea. 44 Ubi ka agāzú nēgo, de kwa aha n'akwukwọ-ha, ka kwa ha akàrà, kpọ kwa ndi-àmà, n'ala Benjamin, na n'ebe nile di Jerusalem buruburu, na n'obodo nile nke Juda, na n'obodo nile nke ugwu, na n'obodo nile nke ebe di ala ala, na n'obodo nile nke Negeb: n'ihi na M'gēme ka ndi-ha adọtara n'agha lata; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

Jeremaia 33

1 Okwu Jehova we rue Jeremaia nti nke ub͕ò abua, mb͕e ya onwe-ya nọ ka onye eb͕ochibidoworo n'ogige ulo-nche, si, 2 Otú a ka Jehova, bú Onye nēme ya, Jehova, bú Onye nākpu ya ime ka o guzosie ike, Onye Jehova bu aha-Ya, siri: 3 Kpọkuem, na M'gāza gi, gosi kwa gi ihe uku di iche iche, nke di kwa ike ighọta, nke i nāmaghi. 4 N'ihi na okwu di otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, kwuru bayere ulo nile nke obodo a, baye-kwa-ra ulo nile nke ndi-eze Juda, nke akwadaworo imegide obo-ihe nile atuliri atuli na imegide mma-agha, si: 5 Ha nābia ibuso ndi Kaldea agha, na imeju ha n'ozu madu ndi M'tib͕uworo n'iwem na n'ọnumam, ndi M'zonariwo-kwa-ra obodo a irum n'ihi ihe ọjọ nile ha. 6 Le, M'gaje ime ka anu-aru ọhu puchie n'aru ya, ya na ngwọta, M'gāgwọta kwa ha; M'gēkpughe-kwa-ra ha nbabiga-ókè nke udo na ezi-okwu. 7 M'gēme kwa ka ndi Juda adọtara n'agha na ndi Israel adọtara n'agha lata, M'gēwu kwa ha dika ulo, dika na mbu. 8 M'gēme kwa ka ha si n'ajọ omume nile ha, bú nke ha mehieworo megidem, di ọcha; M'gāb͕aghara kwa ha ajọ omume-ha nile nke ha mehieworo megidem, na nke ha jehieworo megidem n'ime ha. 9 Obodo a gāghọ-kwa-ram aha obi-utọ, na otuto, na ima-nma, diri mba nile nke uwa, ndi gānu ezi ihe ahu nile nke Mu onwem nēmere ha, ndi gātu kwa oké egwu ma jijiji n'ihi ezi ihe ahu nile na n'ihi udo ahu nile nke Mu onwem nēmere ya. 10 Otú a ka Jehova siri: Agānu kwa ọzọ n'ebe a, nke unu onwe-ūnu nāsi, Nkpọnkpọ ebe ka ọ bu, nke ọ nādighi madu ma-ọbu anumanu nēbi nime ya, ọbuná n'obodo nile nke Juda, na n'èzí nile nke Jerusalem, nke bu ebe tọb͕ọrọ n'efu, nke ọ n'adighi madu, ọ nādighi kwa onye-obibi, ọ nādighi kwa anumanu, nēbi nime ha, 11 agānu kwa ọzọ olu nke obi-utọ na olu ọṅù, na olu nke nwoke nālu nwunye ọhu na olu nke nwanyi anālu ọhu, na olu nke ndi nāsi, Kelenu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, n'ihi na Jehova di nma, n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: na olu nke ndi nēwebata ekele n'ulo Jehova. N'ihi na M'gēme ka ndi ala nka adọtara n'agha lata dika na mbu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 12 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: N'ebe a, nke bu nkpọnkpọ ebe, nke ọ nādighi madu ma-ọbu anumanu nēbi nime ya, na n'obodo-ya nile, ka ebe-obibi nke ndi-ọzùzù-aturu ndi nēme ka ìgwè ewu na aturu-ha makpu gādi kwa ọzọ. 13 N'obodo nile nke ugwu, na n'obodo nile nke ebe di ala ala, na n'obodo nile nke Negeb, na n'ala Benjamin, na n'ebe nile nke di Jerusalem buruburu, na n'obodo nile nke Juda, ka ìgwè ewu na aturu gāgabiga kwa ọzọ n'okpuru aka abua nke onye nāgu ha ọnu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 14 Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gēme ka ezi okwu ahu guzosie ike, bú nke M'gwaworo ulo Israel, nke M'kwuwo-kwa-ra bayere ulo Juda. 15 N'ubọchi ahu, na na mb͕e ahu, ka M'gēme ka Ihe-opupú nke ezi omume puere Devid; ọ gēme kwa ihe ekpere n'ikpe na ezi omume n'ala nka. 16 N'ubọchi ahu ka agāzọputa Juda, Jerusalem gēbi kwa na ntukwasi-obi: nka bu kwa aha nke agākpọ ya, Jehova bu ezi omume-ayi. 17 N'ihi na otú a ka Jehova siri: Agaghi-ebipu n'ulo Devid onye nwe inọkwasi n'oche-eze ulo Israel; 18 ọzọ, agaghi-ebipu n'ulo ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, n'irum onye nwe isure àjà-nsure-ọku, na isure onyinye-inata-iru-ọma dika ihe-nsure-ọku nēsì ísì, utọ, na ichu àjà ubọchi nile. 19 Okwu Jehova we rue Jeremaia nti, si, 20 Otú a ka Jehova siri: Ọ buru na unu gēmebi ọb͕ub͕a-ndum nke ehihie, na ọb͕ub͕a-ndum nke abali, ka ehihie na abali we ghara id i na mb͕e-ha; 21 ya bu na agēmebi ọb͕ub͕a-ndum, nke Mu na Devid, bú orùm, b͕ara, ka o we ghara inwe nwa-nwoke nke bu eze n'elu oche-eze-ya; na ọb͕ub͕a-ndum nke Mu na ndi Livai, bú ndi-nchu-àjà, ndi nējerem ozi, b͕ara. 22 Otú agaghi-agu usu ihe di n'elu-igwe ọnu, na otú agaghi-atùta ájá nke oké osimiri; otú a ka M'gēme ka nkpuru Devid, bú orùm, na ndi Livai ndi nējerem ozi, ba uba. 23 Okwu Jehova we rue Jeremaia nti, si, 24 Ì hughi ihe ndi nka kwuworo, si, Ab͕uru abua nke Jehova rọputara, Ọ juworo ha? ọ bu kwa ndim ka ha nēlelì anya, ha we ghara ibu kwa mba n'iru ha ọzọ. 25 Otú a ka Jehova siri: Ọ buru na ọb͕ub͕a-ndum nke ehihie na abali adighi, ọ buru na atọghm ukpuru nile nke elu-igwe na uwa; 26 ya bu na M'gāju nkpuru Jekob, na Devid, bú orùm, M'we ghara isi na nkpuru-ya were ndi ganāchi nkpuru nke Abraham na Aisak na Jekob: n'ihi na M'gēme ka ndi-ha adọtara n'agha lata, M'gēnwe kwa obi-ebere n'aru ha.

Jeremaia 34

1 Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, mb͕e Nebukadneza, bú eze Babilon, na usu-ndi-agha-ya nile, na ala-eze nile nke uwa nke aka-ya nāchi, na ndi nile di iche iche, nēbuso Jerusalem, nēbuso kwa obodo-ya nile, agha, si: 2 Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, Je, gwa Zedekaia, bú eze Juda, okwu, si ya, Otú a ka Jehova siri, Le, M'gaje inye obodo a n'aka eze Babilon, ọ gēsure kwa ya n'ọku: 3 ma gi onwe-gi aghaghi-iwepuga onwe-gi n'aka-ya, kama aghaghi iwere gi, ọ bu kwa n'aka-ya ka agēnye gi; anya-gi abua gāhu kwa anya abua nke eze Babilon, unu gēkwurita kwa ọnu na ọnu, ọ bu kwa Babilon ka i gābà. 4 Ma otú ọ di, nuru okwu Jehova, gi Zedekaia, bú eze Juda: okwu di otú a ka Jehova kwuru bayere gi, si, I gaghi-anwu site na mma-agha: 5 n'udo ka i gānwu; ọzọ, nsure nile nke nna-gi-hà, bú ndi-eze mbu, ndi buru gi uzọ, otú a ka ha gēsurere gi ihe; ọzọ, Éwù, onye-nwe-ayi! ka ha gāsi n'itiri gi aka n'obi; n'ihi na okwu ka Mu onwem kwuworo; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 6 Jeremaia, bú onye-amuma, we gwa Zedekaia, bú eze Juda, okwu ndia nile nime Jerusalem, 7 mb͕e usu-ndi-agha nke eze Babilon nēbuso Jerusalem, nēbuso kwa obodo Juda nile fọduru, agha, bú Lekish na Azeka; n'ihi na nání ndia fọduru nime obodo nile nke Juda, bú obodo ewusiri ike. 8 Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, mb͕e Zedekaia, bú eze, na ndi Israel nile ndi nọ Jerusalem, b͕asiri ndu, ikpọsara ha si na ha nwere onwe-ha; 9 na ha nile gēzilaga, onye ọ bula orù-ya nwoke, na onye ọ bula nwanyi nējere ya ozi, nke bu nwoke Hibru ma-ọbu nwanyi Hibru, inwere onwe-ya; ka madu we ghara ime ka ha fè ya òfùfè-orù, onye ọ bula o me ka onye-Ju, bú nwa-nne-ya, fè ya: 10 ndi-isi nile na ndi Israel nile we nuru, bú ndi bàra n'ọb͕ub͕a-ndu ahu, izilaga, onye ọ bula orù-ya nwoke, na onye ọ bula nwanyi nējere ya ozi, inwere onwe-ha, ka madu ọ bula we ghara ime kwa ka ha fè ya òfùfè-orù ọzọ; ha we nuru, zilaga ha: 11 ma emesia ha chighariri, me ka ndi-orù-ha ndikom na ndinyom ndi nējere ha ozi, bú ndi ha zilagarari inwere onwe-ha, lata, ha we buda ha ka ha buru orù-ndikom na ndinyom nējere ha ozi: 12 okwu Jehova we rue Jeremaia nti site na Jehova, si, 13 Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri: Mu onwem na nna-unu-ha b͕ara ndu n'ubọchi M'mere ka ha si n'ala Ijipt, n'ulo ndi-orù, puta, si, 14 N'ọgwugwu arọ asa unu gēzilaga, onye ọ bula nwa-nne-ya, bú onye-Hibru, nke rere onwe-ya n'aka-gi, we fè gi arọ isi, i gēzilaga ya inwere onwe-ya: ma nna-unu-hà egeghm nti, ha atọghi kwa nti-ha n'ala. 15 Unu onwe-unu we chigharia ta, we me ihe ziri ezi n'anyam abua, n'ikpọsa, onye ọ bula ọ gwa madu-ibe-ya, si ka o nwere onwe-ya pua n'aka-gi; unu we b͕a ndu n'irum n'ulo nke akpọkwasiri aham: 16 unu we chigharia me ka aham ghara idi nsọ, me, onye ọ bula o me orù-ya nwoke, onye ọ bula o me nwanyi nke nējere ya ozi, ka ha lata, bú ndi unu zilagarari inwere onwe-ha n'ọchichọ nkpuru-obi-ha; unu we buda ha iburu unu orù-ndikom na ndinyom nējere unu ozi. 17 N'ihi nka ka Jehova ji si otú a: Unu onwe-unu egeghm nti, ikpọsa, onye o bula ọ gwa nwa-nne-ya, onye ọ bula o gwa madu-ibe-ya, si ka o nwere onwe-ya: le, M'nākpọsara unu si na unu nwere onwe-unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ibà na mma-agha, na ibà n'ajọ ọria nēfe efe, na ibà n'oké unwu; M'gēwere kwa unu nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari. 18 M'gēwere kwa ndikom ndi nējehie n'ọb͕ub͕a-ndum nye, bú ndi nēmeghi ka okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu ahu nke ha b͕ara n'irum guzosie ike, bú nwa-ehi nke ha kpọwara abua, we gabiga n'etiti nkpọwa-ya abua; 19 bú ndi-isi Juda, na ndi-isi Jerusalem, na ndi-onozi, na ndi-nchu-àjà, na ndi nile nke ala nka, ndi gabigaworo n'etiti nkpọwa abua nke nwa-ehi ahu; 20 M'gēwere ha nye n'aka ndi-iro-ha, na n'aka ndi nāchọ ndu-ha: ozu-ha ewe ghọrọ anu-ufe nke elu-igwe, ghọ-kwa-ra anu-ọhia nke uwa, ihe-oriri. 21 Ọ bu kwa Zedekaia, bú eze Juda, na ndi-isi-ya ka M'gēnye n'aka ndi-iro-ha, na n'aka ndi nāchọ ndu-ha, na n'aka usu-ndi-agha nke eze Babilon, ndi nēsi n'ebe unu nọ rigo la. 22 Le, M'gaje inye iwu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), me ka ha biaghachi n'obodo a; ha gēbuso kwa ya agha, were ya, sure ya n'ọku: ọ bu kwa obodo nile nke Juda ka M'gēme ka ha ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ghara inwe onye-obibi.

Jeremaia 35

1 Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti site Jehova n'ubọchi Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, si, 2 Je n'ulo ndi Rikab, gwa ha okwu, me ka ha bata n'ulo Jehova, n'otù n'ime-ulo-ya, me ka ha ṅua manya-vine. 3 M'we kuru Jeazanaia nwa Jeremaia, nwa Habazinaia, na umu-nne-ya, na umu-ya ndikom nile, na ulo nile nke ndi Rikab; 4 m'we me ka ha bata n'ulo Jehova, n'ime-ulo umu Henan nwa Igdalaia, bú onye nke Chineke, nke di n'akuku ime-ulo ndi-isi, nke di n'elu ime-ulo Maaseia nwa Shalum, bú onye-nche nke nbata-uzọ: 5 M'we che n'iru umu ulo ndi Rikab ọkwa ufọdu juputara na manya-vine na iko ufọdu, m'we si ha, Ṅuanu manya-vine. 6 Ha we si, Ayi agaghi-aṅu manya-vine: n'ihi na Jonadab nwa Rikab, bú nna-ayi, nyere ayi iwu, si, Unu aṅula manya-vine, unu onwe-unu, na umu-unu, rue mb͕e ebighi-ebi: 7 unu ewu-kwa-la ulo, unu agha-kwa-la nkpuru, unu aku-kwa-la ubi-vine, unu enwe-kwa-la ihe ndia: kama ọ bu n'ulo-ikwū ka unu gēbi ubọchi nile nke unu; ka unu we di ndu ọtutu ubọchi n'elu ala ahu ebe unu onwe-unu bu ndi-ọbìa. 8 Ayi we ge nti olu Jonadab nwa Rikab, bú nna-ayi, n'ihe nile nke o nyere ayi n'iwu, ighara iṅu manya-vine ubọchi nile ayi, ayi onwe-ayi, na ndinyom-ayi, na umu-ayi ndikom, na umu-ayi ndinyom; 9 na ighara iwu ulo ka ayi we biri nime ha: ọ dighi kwa ubi-vine, ma-ọbu ubi, ma-ọbu nkpuru-ọghigha ayi nwere: 10 ayi we biri n'ulo-ikwū, we ge nti, me dika ihe nile si di nke Jonadab, bú nna-ayi, nyere ayi n'iwu. 11 O rue, mb͕e Nebukadreza, bú eze Babilon, rigotara n'ala nka, na ayi siri, Bianu, ka ayi ba na Jerusalem n'ihi usu-ndi-agha nke ndi Kaldea, na n'ihi usu-ndi-agha nke Siria; ayi we biri na Jerusalem. 12 Okwu Jehova we rue Jeremaia nti, si, 13 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Je, si ndi Juda, si kwa ndi bi na Jerusalem, Ùnu agaghi-anara idọ-aka-na-nti ige nti okwum nile? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 14 Emewo ka okwu nile nke Jonadab nwa Rikab guzosie ike, bú nke o nyere umu-ya n'iwu, ka ha ghara iṅu manya-vine, ha aṅughi kwa manya-vine rue ta, n'ihi na ha anuwo ihe nke nna-ha nyere n'iwu: ma Mu onwem agwawo unu okwu, nēbili n'isi-ututu nēkwu; ma unu egeghm nti. 15 M'we zitere unu ndi-orùm nile, bú ndi-amuma, nēbili n'isi-ututu nēzite ha, si, Biko, sinu, onye ọ bula n'uzọ ọjọ ya, lata, me-kwa-nu ka omume nile unu di nma, unu ejeso-kwa-la chi ọzọ ifè ha, biri-kwa-nu n'ala nka nke M'nyere unu, nye kwa nna-unu-hà: ma unu atọghi nti-unu n'ala, unu egeghkwam nti. 16 N'ihi na umu Jonadab nwa Rikab emewo ka ihe ahu nna-ha nyere n'iwu guzosie ike, bú nke o nyere ha n'iwu, ma ndi nka egeghm nti; 17 n'ihi nka ka Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, ji si otú a: Le, M'gaje ime ka ihe ọjọ ahu nile biakute Juda, biakute kwa ndi nile bi na Jerusalem, bú nke M'kwuworo megide ha: n'ihi na agwawom ha okwu, ma ha anughi; M'we kpọ ha òkù, ma ha azaghi. 18 Jeremaia we si ulo ndi Rikab, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: N'ihi na unu egewo nti ihe Jonadab, bú nna-unu, nyere n'iwu, unu we debe ihe nile o nyere n'iwu, unu we me dika ihe nile si di nke o nyere unu n'iwu; 19 n'ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, ji si otú a: Agaghi-ebipu n'ulo Jonadab nwa Rikab onye nwe iguzo n'irum ubọchi nile.

Jeremaia 36

1 O rue, n'arọ nke-anọ nke Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, na okwu a ruru Jeremaia nti site na Jehova, si, 2 Were n'onwe-gi akwukwọ-npiakọta, de nime ya okwu nile nke M'gwaworo gi imegide Israel, na imegide Juda, na imegide mba nile, site n'ubọchi M'gwara gi okwu, site n'ubọchi Josaia, we rue ta. 3 Eleghi anya ulo Juda gānu ihe ọjọ ahu nile nke Mu onwem nēchè ime ha; ka ha we lata, onye o bula o si n'uzọ ọjọ ya lata; ka M'we b͕aghara ajọ omume-ha na nmehie-ha. 4 Jeremaia we kpọ Beruk nwa Neraia; Beruk we dere n'ọnu Jeremaia okwu nile nke Jehova, nke Ọ gwara ya-ri, n'akwukwọ-npiakọta. 5 Jeremaia we nye Beruk iwu, si, Mu onwem bu onye eb͕ochibidoworo; apughm ibà n'ulo Jehova: 6 ma gi onwe-gi je, gua n'akwukwọ-npiakọta ahu, nke i deworo site n'ọnum, okwu nile nke Jehova na nti ndi Israel, n'ulo Jehova n'ubọchi obubu-ọnu: ọ bu kwa na nti Juda nile ndi si n'obodo nile ha abia ka i gāgu ha. 7 Eleghi anya aririọ-amara-ha gāda n'iru Jehova, ha ewe lata, onye ọ bula o si n'uzọ ọjọ ya lata: n'ihi na ọ di uku, bú iwe ahu na ọnuma ahu nke Jehova kwuworo megide ndi nka. 8 Beruk nwa Neraia we me dika ihe nile si di nke Jeremaia, bú onye-amuma, nyere ya n'iwu, o we gua n'akwukwọ ahu okwu nile nke Jehova n'ulo Jehova. 9 O rue, n'arọ nke-ise nke Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, n'ọnwa nke-iteghete, na ndi nile ndi nọ na Jerusalem, na ndi nile ndi si n'obodo nile nke Juda abata na Jerusalem, kpọsara obubu-ọnu n'iru Jehova. 10 Beruk we gua n'akwukwọ ahu okwu nile nke Jeremaia n'ulo Jehova, n'ime-ulo Gemaraia nwa Shefan, bú ode-akwukwọ, n'ogige nke di n'elu, n'oghere ọnu-uzọ-ama ọhu nke ulo Jehova, na nti ndi Israel nile. 11 Maikaia nwa Gemaraia, nwa Shefan, we nuru okwu nile nke Jehova nke sitere n'akwukwọ ahu, 12 o we rida n'ulo eze, rue ime-ulo nke ode-akwukwọ: ma, le, n'ebe ahu ka ndi-isi nile nānọdu, bú Elishama ode-akwukwọ, na Delaia nwa Shemaia, na Elnetan nwa Akboa, na Gemaraia nwa Shefan, na Zedekaia nwa Hananaia, na ndi-isi nile. 13 Maikaia we gosi ha okwu nile ọ nuru, mb͕e Beruk nāgu akwukwọ ahu na nti ndi Israel nile. 14 Ndi-isi nile we zìe Jehudi nwa Netanaia, nwa Shelemaia, nwa Kushi, jekuru Beruk, si, Akwukwọ-npiakọta ahu nke iguworo ihe nime ya na nti ndi Israel, were n'aka-gi bia. Beruk nwa Neraia we were akwukwọ-npiakọta ahu n'aka-ya, biakute ha. 15 Ha we si ya, Biko, nọdu ala, gua ya na nti-ayi. Beruk we gua ya na nti-ha. 16 O rue, mb͕e ha nusiri okwu ndia nile, na ha turu oké egwu, onye na ibe-ya, ha we si Beruk, Ayi aghaghi igosi eze okwu ndia nile. 17 Ha we jua Beruk, si, Biko, gosi ayi, Ì siri aṅa deputa okwu ndia nile n'ọnu-ya? 18 Beruk we si ha, N'ọnu-ya ka ọ nākpọrọm okwu ndia nile, ma mu onwem were ink ede ha n'akwukwọ a. 19 Ndi-isi we si Beruk, Je, zobe onwe-gi, gi onwe-gi na Jeremaia; ekwe-kwa-la onye ọ bula mara ebe unu onwe-unu nọ. 20 Ha we bakuru eze n'ogige; ma ha debereri akwukwọ-npiakọta ahu n'ime-ulo Elishama, bú ode-akwukwọ; ha we gosi okwu nile na nti abua nke eze. 21 Eze we ziga Jehudi iweta akwukwọ-npiakọta ahu: o we weputa ya n'ime-ulo Elishama, bú ode-akwukwọ. Jehudi we gua ya na nti abua nke eze, na na nti ndi-isi nile ndi nēguzo n'akuku eze. 22 Ma eze nānọdu n'ulo mb͕e oyi n'ọnwa nke-iteghete: ọku nēnwu kwa n'ite-ọku nke di n'iru ya. 23 O rue, mb͕e Jehudi gusiri ibe akwukwọ atọ ma-ọbu anọ, na o ji mma ode-akwukwọ bìkasia ya, tubà ya n'ọku nke di n'ite-ọku, rue mb͕e akwukwọ-npiakọta ahu resiri n'ọku nke di n'ite-ọku. 24 Ma ha atughi oké egwu, ha adọwaghi kwa uwe-ha, bú eze na ndi-orù-ya nile ndi nānu okwu ndia nile. 25 Ọzọ kwa, Elnetan na Delaia na Gemaraia riọrọri eze arìriọ ka ọ ghara isure akwukwọ-npiakọta ahu: ma o geghi ha nti. 26 Eze we nye Jeramil nwa eze na Seraia nwa Azriel na Shelemaia nwa Abdeel iwu iwere Beruk, bú ode-akwukwọ, Jeremaia, bú onye-amuma: ma Jehova zobere ha. 27 Okwu Jehova we rue Jeremaia nti, mb͕e eze suresiri akwukwọ-npiakọta ahu, na okwu nile nke Beruk deputara n'ọnu Jeremaia, si, 28 Were kwa n'onwe-gi akwukwọ-npiakọta ọzọ, dekwasi na ya okwu mbu nile nke di n'elu akwukwọ-npiakọta mbu, nke Jehoiakim, bú eze Juda, sureworo ọku. 29 Ma i gēkwu okwu bayere Jehoiakim, bú eze Juda, si, Otú a ka Jehova siri: Gi onwe-gi esurewo akwukwọ-npiakọta nka ọku, si, Gini mere i ji dekwasi n'akwukwọ a, si, Eze Babilon aghaghi ibia bibie ala nka, me ka madu na anumanu kwusi nime ya? 30 N'ihi nka ka Jehova ji kwue okwu di otú a bayere Jehoiakim, bú eze Juda, si: Ọ gaghi-enwe onye ganānọkwasi n'oche-eze Devid: ọzọ, ozu-ya gābu ihe etufuworo nye ọkpukpọ-nku n'ehihie, nye kwa ọtutu-oyi n'abali. 31 M'gēji kwa ajọ omume-ha leta ya, leta kwa nkpuru-ya, leta kwa ndi-orù-ya; M'gēme kwa ka ihe ọjọ ahu nile nke M'gwara ha, ma ha anughi, biakwasi ha, biakwasi kwa ndi bi na Jerusalem, biakwasi kwa ndi Juda. 32 Ma Jeremaia were akwukwọ-npiakọta ọzọ nye Beruk nwa Neraia, bú ode-akwukwọ; o we dere n'ọnu Jeremaia n'elu ya okwu nile nke akwukwọ ahu nke Jehoiakim, bú eze Juda, surereri n'ọku; ọzọ kwa, atukwasiri n'elu ha ọtutu okwu dika ha.

Jeremaia 37

1 Zedekaia nwa Josaia we ghọ eze n'ọnọdu Konaia nwa Jehoiakim, onye Nebukadreza, bú eze Babilon, mere ka ọ buru eze n'ala Juda. 2 Ma ọ geghi nti, ya onwe-ya, ma ndi-orù-ya, ma ndi ala ahu, n'okwu nile nke Jehova, nke O kwuru site n'aka Jeremaia, bú onye-amuma. 3 Zedekaia, bú eze, we zìe Jehukal nwa Shelemaia, na Zefanaia nwa Maaseia, bú onye-nchu-àjà, jekuru Jereamia, bú onye-amuma, si, Biko, kpere ayi Jehova, bú Chineke-ayi, ekpere. 4 Ma Jeremaia nābata nāpu kwa n'etiti ndi Israel: n'ihi na ha etiyeghi ya n'ulo-nkpọrọ. 5 Ọzọ, usu-ndi-agha Fero esiwo n'Ijipt puta: ndi Kaldea ndi nānọchigide Jerusalem n'agha we nuru akukọ-ha, ha we si n'imegide Jerusalem rigo. 6 Okwu Jehova we rue Jeremaia, bú onye-amuma, nti, si, 7 Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri: Otú a ka unu gāsi eze Juda, onye zìworo unu biakutem ijum ase; Le, usu-ndi-agha Fero, nke putaworo iyere unu aka, gālaghachi n'ala-ya, bú Ijipt. 8 Ndi Kaldea gābiaghachi kwa, buso obodo a agha; ha gēwere kwa ya, sure ya n'ọku. 9 Otú a ka Jehova siri: Unu arafula nkpuru-obi-unu, si, Ndi Kaldea aghaghi isi n'imegide ayi la: n'ihi na ha agaghi-ala. 10 N'ihi na ọ buru na unu etib͕usia usu-ndi-agha nile nke ndi Kaldea ndi nēbuso unu agha, nání ndi adupúru adupú ewe fọdu n'etiti ha, ma ha gēbili, onye ọ bula n'ulo-ikwū-ya, we sure obodo a n'ọku. 11 O rue, mb͕e usu-ndi-agha nke ndi Kaldea siri n'imegide Jerusalem rigo n'ihi usu-ndi-agha Fero, 12 na Jeremaia siri na Jerusalem pua ije ala Benjamin, iketa òkè-ya n'ebe ahu, n'etiti ndi Israel. 13 O rue, mb͕e ọ nọ n'ọnu-uzọ-ama Benjamin, na otù onye-nwe nlekọta nọ n'ebe ahu, onye aha-ya bu Iraija nwa Shelemaia, nwa Hananaia; o we jide Jeremaia, bú onye-amuma, si, Ndi Kaldea ka gi onwe-gi nādakuru. 14 Jeremaia we si, Ọ bu okwu-ugha; adighm-adakuru ndi Kaldea; ma o geghi ya nti: Iraija we jide Jeremaia, me ka ọ biakute ndi-isi. 15 Ndi-isi we wesa Jeremaia iwe, tie ya ihe, tiye ya n'ulo-nkpọrọ, bú ulo Jonatan ode-akwukwọ; n'ihi na ulo ahu ka ha mereri ulo-nkpọrọ. 16 Mb͕e Jeremaia batara n'ulo olùlù, na n'ime-ulo ntà ya, Jeremaia we nọdu n'ebe ahu ọtutu ubọchi; 17 eze, bú Zedekaia, we ziga, kuta ya: eze we jua ya n'ulo-ya na nzuzo, si, Ọ̀ di okwu ọ bula sitere na Jehova? Jeremaia we si, Okwu di. O we si, N'aka eze Babilon ka agēnye gi. 18 Jeremaia we si eze, bú Zedekaia, Gini ka m'mehieworo megide gi, ma-ọbu megide ndi-orù-gi, ma-ọbu megide ndi nka, na unu tiyeworo mu onwem n'ulo-nkpọrọ? 19 Òle ebe kwa ka ndi-amuma-unu nọ, bú ndi buru unu amuma, si, Eze Babilon agaghi-abia imegide unu, ma-ọbu imegide ala nka? 20 Ma ub͕u a, biko, nuru, onye-nwem, eze: biko, ka aririọ-amaram da n'iru gi; eme-kwa-la ka m'laghachi n'ulo Jonatan, bú ode-akwukwọ, ka m'we ghara inwu n'ebe ahu. 21 Eze, bú Zedekaia, we nye iwu, ha we tiye Jeremaia n'ogige ulo-nche, nēnye ya otù ob͕e achicha kwa-ubọchi site n'èzí ndi-osi-ite, rue mb͕e achicha nile nke di n'obodo gwusiri. Jeremaia we nọgide n'ulo-nche.

Jeremaia 38

1 Shefataia nwa Matan, na Gedalaia nwa Pashua, na Jukal nwa Shelemaia, na Pashua nwa Malkija, we nuru okwu nile nke Jeremaia nāgwa ndi Israel nile, si, 2 Otú a ka Jehova siri, Onye nānọgide n'obodo a gānwu site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe: ma onye nāpukuru ndi Kaldea gādi ndu, ndu-ya ewe ghọrọ ya ihe-nkwata, o we di ndu. 3 Otú a ka Jehova siri, Aghaghi inye obodo a n'aka usu-ndi-agha nke eze Babilon, ọ gēwere kwa ya. 4 Ndi-isi we si eze, Biko, ka eme ka nwoke a nwua; n'ihi na ya onwe-ya nēme ka aka ndi-agha kuda, bú ndi fọduru n'obodo a, na aka ndi Israel nile, n'igwa ha okwu dika okwu ndia: n'ihi na nwoke a adighi-achọrọ ndi nka udo, kama ọ bu ihe ọjọ. 5 Eze, bú Zedekaia, we si, Le, onye ahu di n'aka-unu: n'ihi na eze abughi onye puru ime ihe ọ bula megide unu. 6 Ha we were Jeremaia, tubà ya n'olùlù Malkija nwa eze, nke di n'ogige ulo-nche: ha we chiri udọ̀ rada Jeremaia. Ma miri adighi n'olùlù ahu, ọ bu nání apiti: Jeremaia we mibe n'apiti ahu. 7 Ebed-melek, bú onye Etiopia, onye bu onozi, nke nọ n'ulo eze, we nuru na ha tiyereri Jeremaia n'olùlù; ma eze nānọdu n'ọnu-uzọ-ama Benjamin; 8 Ebed-melek we si n'ulo eze puta, gwa eze okwu, si, 9 Onye-nwem eze, ndikom ndia emewo ihe ọjọ n'ihe nile nke ha meworo Jeremaia, bú onye-amuma, onye ha tubàworo n'olùlù ahu; o we nọ n'ọnwu n'ọnọdu-ya n'ihi oké unwu: n'ihi na nri adighi kwa ọzọ n'obodo a. 10 Eze we nye Ebed-melek, bú onye Etiopia, iwu, si, Si n'ebe a chiri orú ndikom na iri n'aka-gi, me ka Jeremaia, bú onye-amuma, si n'olùlù ahu rigoputa, tutu ọ nwua. 11 Ebed-melek we chiri ndikom ahu n'aka-ya, ba n'ulo eze n'okpuru ulo-àkù, chiputa n'ebe ahu nkirika ákwà nke dọkara adọka na nkirika ákwà nke kara nká, o we chiri udọ̀ radara ha Jeremaia n'olùlù ahu. 12 Ebed-melek, bú onye Etiopia, we si Jeremaia, Biko, tiye nkirika ákwà ndia nke dọkara adọka na nke kara nká n'okpuru nkpa-abu-gi abua n'okpuru udọ̀. Jeremaia we me otú a. 13 Ha we chiri udọ̀ ahu dọgota Jeremaia, we me ka o si n'olùlù ahu rigoputa: Jeremaia we nọgide n'ogige ulo-nche ahu. 14 Eze, bú Zedekaia, we ziga, kutara onwe-ya Jeremaia, bú onye-amuma, rue nbata nke-atọ nke di n'ulo Jehova: eze we si Jeremaia, Mu onwem gaje iju gi otù ihe; ezonarilam ihe ọ bula. 15 Jeremaia we si Zedekaia, Mb͕e m'gēgosi gi, ì gaghi-eme ka m'nwua n'ezie? ọzọ, mb͕e m'gādu gi ọdu, i gaghi-egem nti. 16 Eze, bú Zedekaia, we ṅuara Jeremaia iyi na nzuzo, si, Jehova nādi ndu, bú Onye ahu nke nyere ayi ndu a, m'gaghi-eme ka i nwua ma-ọli, m'gaghi-enye kwa gi ma-ọli n'aka ndikom ndia ndi nāchọ ndu-gi. 17 Jeremaia we si Zedekaia, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke Israel, siri: Ọ buru na i gāpukuru ndi-isi eze Babilon n'ezie, nkpuru-obi-gi gādi kwa ndu, agaghi-esure kwa obodo a n'ọku; i gādi kwa ndu, gi onwe-gi na ulo-gi: 18 ma ọ buru na i pukughi ndi-isi eze Babilon, agēnye kwa obodo a n'aka ndi Kaldea, ha gēsure kwa ya n'ọku, gi onwe-gi agaghi-ewepuga onwe-gi n'aka-ha. 19 Eze, bú Zedekaia, we si Jeremaia, Mu onwem nātu egwu ndi-Ju ndi dakuruworo ndi Kaldea, na ha gēnyem n'aka-ha, ha ewe kwam emò. 20 Jeremaia we si, Ha agaghi-enye gi n'aka-ha. Biko, ge nti olu Jehova, n'ihe nke mu onwem nāgwa gi: o we diri gi nma, nkpuru-obi-gi gādi kwa ndu. 21 Ma ọ buru na gi onwe-gi aju na i gaghi-apu, nka bu okwu nke Jehova meworo ka m'hu: 22 Le, ndinyom ahu nile ndi fọduru n'ulo eze Juda gābu ndi emeworo ka ha pukuru ndi-isi eze Babilon, ndinyom ahu ganāsi kwa, Ndi gi na ha di n'udo akpaliwo gi, we nwe ike n'aru gi: ukwu-gi abua emiwo n'apiti, ha we laghachi azu. 23 Ọ bu kwa ndinyom-i nile na umu-gi ka ha ganēme ka ha pukuru ndi Kaldea: gi onwe-gi agaghi-ewepuga onwe-gi n'aka-ha, kama aka eze Babilon gējide gi: ọ bu kwa obodo a ka i gēsure n'ọku. 24 Zedekaia we si Jeremaia, Ekwela ka onye ọ bula mara okwu ndia, i gaghi-anwu kwa. 25 Ma mb͕e ndi-isi gānu na mu na gi ekwuwo okwu, ha we biakute gi, si gi, Biko, gosi ayi ihe i gwaworo eze; ezonarila ayi ya, ayi agaghi-eme kwa ka i nwua: gosi kwa ayi ihe eze gwara gi: 26 i gāsi kwa ha, Mu onwem nēme ka aririọ-amaram da n'iru eze, ka ọ ghara ime ka m'laghachi n'ulo Jonatan, inwu n'ebe ahu. 27 Ndi-isi nile we biakute Jeremaia, jua ya: o we gosi ha dika okwu ndia nile si di nke eze nyere ya n'iwu. Ha we debe ọnu-ha du, rapu ya; n'ihi na anughi okwu ahu. 28 Jeremaia we nọgide n'ogige ulo-nche rue ubọchi ewere Jerusalem. O rue, mb͕e ewere Jerusalem,

Jeremaia 39

1 (n'arọ nke-iteghete nke Zedekaia, bú eze Juda, n'ọnwa nke-iri, ka Nebukadreza, bú eze Babilon, na usu-ndi-agha-ya nile, biaruru Jerusalem, we nọchigide ya n'agha; 2 n'arọ nke-iri-na-otù nke Zedekaia, n'ọnwa nke-anọ, n'ubọchi nke-iteghete nke ọnwa ahu, ka awapuru n'obodo ahu: ) 3 na ndi-isi nile nke eze Babilon batara, we nọdu n'ọnu-uzọ-ama nke etiti, bú Neagal-shareza, na Samga-nebo, na Sasekim, bú Rab-saris, na Neagal-shareza, bú Rab-mag, na ndi-isi nile nke eze Babilon fọduru. 4 O rue, mb͕e Zedekaia, bú eze Juda, na ndi-agha nile huru ha, na ha b͕alagara, were abali si n'obodo ahu pua, n'uzọ ubi eze ab͕ara ogige, n'ọnu-uzọ-ama nke di n'etiti mb͕idi abua: o we pua ga n'uzọ Araba. 5 Usu-ndi-agha nke ndi Kaldea we chua ha n'azu; rue Zedekaia aru n'ala ihe nādighi nke Jeriko: ha we jide ya, me ka ọ rigokuru Nebukadreza, bú eze Babilon, rue Ribla n'ala Hemat, o we kwue okwu ikpé n'ebe ọ nọ. 6 Eze Babilon we b͕ue umu-ndikom Zedekaia nime Ribla n'anya-ya: ọ bu kwa ndi nile nke Juda amara aha-ha ka eze Babilon b͕uru. 7 O me-kwa-ra ka Zedekaia kpue ìsì n'anya-ya abua, o were kwa ihe-ọla eji ke ukwu ke ya ab͕u, ime ka ọ ba Babilon. 8 Ọ bu kwa ulo eze na ulo nile nke ndi Israel ka ndi Kaldea surere n'ọku, ha kwatu-kwa-ra mb͕idi nile nke Jerusalem. 9 Ma ndi Israel nke fọduru, bú ndi fọduru n'obodo ahu, na ndi dapuru adapu, bú ndi dapuru jekuru ya, na ndi Israel fọduru, bú ndi fọduru n'ebe ahu, ndia ka Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ha je biri na Babilon. 10 Ma Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ufọdu nime ndi Israel ndi nēnweghi ike, bú ndi nēnweghi ihe ọ bula, fọdu n'ala Juda, o we nye ha ubi-vine na ubi n'ubọchi ahu. 11 Nebukadreza, bú eze Babilon, we nye Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, iwu bayere Jeremaia, si, 12 Were ya, ka anya-gi abua di n'aru ya, eme-kwa-la ya ihe ọjọ ọ bula; kama dika ọ gēsi gwa gi, me ya otú a. 13 Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, we ziga, ya na Nebushazban, bú Rab-saris, na Neagal-shareza, bú Rab-mag, na ndi-isi nile nke eze Babilon; 14 ha we ziga, weputa Jeremaia n'ogige ulo-nche, nye ya n'aka Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, ka o we me ka ọ pua la: o we biri n'etiti ndi Israel. 15 Ọ bu kwa Jeremaia ka okwu Jehova ruru nti, mb͕e ọ nọ ka onye eb͕ochibidoworo n'ogige ulo-nche, si, 16 Je, gwa Ebed-melek, bú onye Etiopia, okwu, si, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Le, M'gaje ime ka okwum nile biarue obodo a ime ya ihe ọjọ, ọ bughi ime ya ezi ihe; ha gādi kwa n'iru gi n'ubọchi ahu. 17 Ma M'gānaputa gi ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): agaghi-enye kwa gi n'aka ndi ahu gi onwe-gi nātu egwu ha. 18 N'ihi na aghaghm ime ka i wepuga onwe-gi, ọ bughi kwa na mma-agha ka i gāda, kama ndu-gi gāghọrọ gi ihe-nkwata: n'ihi na i b͕abàwo nimem: ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

Jeremaia 40

1 Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, mb͕e Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, zilagasiri ya site na Rema, ka o weresiri ya mb͕e ọ bu onye ejiri nkpọrọ ke ab͕u n'etiti ndi Jerusalem na Juda nile ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, bú ndi emere ka ha je biri na Babilon. 2 Onye-isi ndi-ob͕ū we were Jeremaia, si ya, Jehova, bú Chineke-gi, kwuru ihe ọjọ a megide ebe a: 3 Jehova we me ka ọ bia, O we me dika O kwuru; n'ihi na unu emehiewo megide Jehova, ma unu egeghi nti olu-Ya, n'ihi nka ka ihe a ruworo unu aru. 4 Ma ub͕u a, le, atọpuwom i ta na nkpọrọ nke di n'aka-gi. Ọ buru na ọ di nma a'anya-gi isorom bia na Babilon, bia, anyam gādi kwa a'aru gi; ma ọ buru na ọ jọrọ njọ n'anya-gi isorom bia na Babilon, ghara: le, ala nka nile di n'iru gi; n'ebe di nma na n'ebe ziri ezi n'anya-gi ije, je n'ebe ahu. 5 Ma mb͕e ọ kālaghachighi, ọ si ya, Ma-ọbu laghachikuru Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, onye eze Babilon meworo onye-nlekọta obodo nile nke Juda, gi na ya biri n'etiti ndi-gi: ma-ọbu je ebe ọ bula ziri ezi n'anya-gi ije. Onye-isi ndi-ob͕ū we nye ya òkè ihe-oriri na onyinye, zilaga ya. 6 Jeremaia we biakute Gedalaia nwa Ahaikam rue Mizpa, ya na ya we biri n'etiti ndi Israel ndi fọduru n'ala-ha. 7 Ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha ndi nọ n'ọhia, ha onwe-ha na ndikom-ha, we nu na eze Babilon mere Gedalaia nwa Ahaikam onye-nlekọta n'ala-ha, na o me-kwa-ra ya onye-nlekọta nke ndikom na ndinyom na umu-ntakiri, bú ufọdu nime ndi nēnweghi ike n'ala, nime ndi anēmeghi ka ha je biri na Babilon; 8 ha we biakute Gedalaia rue Mizpa, bú Ishmael nwa Netanaia, na Johanan na Jonatan, bú umu Karea, na Seraia nwa Tanhumet, na umu Efai, bú onye Netofa, Jezanaia nwa onye Meaka, ha onwe-ha na ndikom-ha. 9 Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, we ṅuara ha iyi, ṅu-kwa-ra ndikom-ha, si, Unu atula egwu ifè ndi Kaldea: birinu n'ala, fè kwa eze Babilon, ọ gādi-kwa-ra unu nma. 10 Ma mu onwem, le, m'ganēbi na Mizpa, iguzo n'iru ndi Kaldea, ndi gābiakute ayi: ma unu onwe-unu, chikọtanu manya-vine na nkpuru nke mb͕e nghọkọta-nkpuru na manu, tiye ha n'ihe-unu, biri-kwa-nu n'obodo nile unu nke unu wereworo. 11 Ọzọ kwa, ndi-Ju nile ndi nọ na Moab, na n'etiti umu Amon, na n'Edom, na ndi nọ n'ala nile, nuru na eze Babilon enyewo Juda ndi fọduru, na o mewo kwa Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, onye-nlekọta-ha; 12 ndi-Ju nile we si n'ebe nile achugara ha-ri lata, we bata n'ala Juda, biakute Gedalaia, rue Mizpa, we chikọta manya-vine na nkpuru nke mb͕e nghọkọta-nkpuru nke-uku. 13 Ọzọ, Johanan nwa Karea, na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha ndi nọ n'ọhia, biakutere Gedalaia rue Mizpa, 14 si ya, Ì mara n'ezie na Bealis, bú eze umu Amon, ezitewo Ishmael nwa Netanaia itib͕u gi onwe-gi? Ma Gedalaia nwa Ahaikam ekweghi ihe ha kwuru. 15 Johanan nwa Karea we gwa Gedalaia okwu na nzuzo nime Mizpa, si, Biko, ka m'je, m'gētib͕u kwa Ishmael nwa Netanaia, ma ọ dighi onye ọ bula gāma: n'ihi gini ka o gētib͕u gi onwe-gi, Juda nile ewe b͕asa, bú ndi achikọtaworo n'ebe i nọ, ndi Juda fọduru ewe la n'iyì? 16 Gedalaia nwa Ahaikam we si Johanan nwa Karea, Emela ihe a: n'ihi na okwu-ugha ka gi onwe-gi nēkwu bayere Ishmael.

Jeremaia 41

1 O rue, n'ọnwa nke-asa, na Ishmael nwa Netanaia, nwa Elishama, onye sitere na nkpuru ndi nwe ala-eze, onye bu kwa otù nime ndi-isi nke eze, ya na-ndikom iri, biakutere Gedalaia nwa Ahaikam rue Mizpa; ha we rikọ nri n'ebe ahu na Mizpa. 2 Ishmael nwa Netanaia we bilie, ya na ndikom iri ahu ndi ya na ha yikọrọ bia, ha we were mma-agha tib͕ue Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, we me ka ọ nwua, bú onye eze Babilon mere onye-nlekọta ala ahu. 3 Ọ bu kwa ndi-Ju nile ndi ha na ya, bú Gedalaia, nọ, nime Mizpa, na ndi Kaldea ndi ahuru n'ebe ahu, bú ndi-agha, ka Ishmael tib͕uru. 4 O rue, n'ubọchi nke-abua mb͕e emesiri ka Gedalaia nwua, ma ọ dighi onye ọ bula mara ya, 5 na madu ufọdu siri na Shekem, si kwa na Shailo, si kwa na Sameria, bia, bú ọgu ndikom anọ, ndi akọpusiri afu-ọnu-ha, ndi uwe nile ha dọwara adọwa, ndi nēbì kwa onwe-ha mma, jide onyinye-inata-iru-ọma na frankincense n'aka-ha, iwebata ya n'ulo Jehova. 6 Ishmael nwa Netanaia we si na Mizpa pua izute ha, nēje ije nākwa ákwá: o rue, mb͕e o zutere ha, na ọ siri ha Biakutenu Gedalaia nwa Ahaikam. 7 O rue, mb͕e ha batara n'etiti obodo, na Ishmael nwa Netanaia b͕uru ha, tubà ha n'etiti olùlù, ya onwe-ya na ndikom ndi ya na ha nọ. 8 Ma achọtara ndikom iri n'etiti ha ndi siri Ishmael, Emela ka ayi nwua: n'ihi na ayi nwere àkù zoro ezo n'ọhia, bú ọka wheat, na ọka barley, na manu, na manu-aṅu. O we rapu, ghara ime ka ha nwua n'etiti umu-nne-ha. 9 Ma olùlù ahu ebe Ishmael tubàra ozu nile nke ndikom ahu ndi o tib͕uru, n'akuku Gedalaia, (olùlù ahu bú nke Esa, bú eze, mereri n'ihi Beasha, bu eze Israel, ) olùlù ahu ka Ishmael nwa Netanaia were ndi eb͕uru eb͕u tujue. 10 Ishmael we dọta ndi Israel nile fọduru ndi nọ na Mizpa n'agha, bú umu-ndinyom eze, na ndi Israel nile fọduru na Mizpa, ndi Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere Gedalaia nwa Ahaikam onye-nlekọta-ha: Ishmael nwa Netanaia we dọta ha n'agha, je igabigakuru umu Amon. 11 Johanan nwa Karea na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha so ya we nu ihe ọjọ ahu nile nke Ishmael nwa Netanaia mere, 12 ha we chiri ndikom-ha nile, je ibuso Ishmael nwa Netanaia agha, ha we chọta ya n'akuku miri bara uba nke di na Gibeon. 13 O rue, mb͕e ndi Israel nile ndi ha na Ishmael nọ huru Johanan nwa Karea, na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha ndi ya na ha nọ, ha we ṅuria ọṅu. 14 Ndi Israel nile ndi Ishmael siri na Mizpa dọta n'agha we chigharia, lata, jekuru Johanan nwa Karea. 15 Ma Ishmael nwa Netanaia chiri ndikom asatọ wepuga onwe-ya n'aka Johanan, jekuru umu Amon. 16 Johanan nwa Karea na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha so ya we chiri ndi Israel nile fọduru, bú ndi o mere ka ha si n'aka Ishmael nwa Netanaia lata, site na Mizpa, mb͕e o tib͕usiri Gedalaia nwa Ahaikam, bú ndikom, ndi bu ndi-agha, na ndinyom, na umu-ntakiri, na ndi-onozi, ndi o mere ka ha si na Gibeon lata: 17 ha we je, nọdu na Gerut Kimham, nke di n'akuku Bet-lehem, ije ba n'Ijipt, 18 n'ihi ndi Kaldea: n'ihi na ha turu egwu ha, n'ihi na Ishmael nwa Netanaia etib͕uwo Gedalaia nwa Ahaikam, onye eze Babilon mere onye-nlekọta ala-ha.

Jeremaia 42

1 Ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha, na Johanan nwa Karea, na Jezanaia nwa Hoshaia, na ndi Israel nile site n'onye dikarisiri ntà we rue onye dikarisiri uku, we biarue nso, 2 si Jeremaia, bú onye-amuma, Biko, ka aririọ-amara-ayi da n'iru gi, gi kpere ayi Jehova, bú Chineke-gi, ekpere, kpe ekpere bayere ndia nile fọduru; n'ihi na ayi fọduru nànì madu ole-na-ole si n'ọtutu madu puta, dika anya-gi abua si ahu ayi: 3 ka Jehova, bú Chineke-gi, we gosi ayi uzọ ahu nke ayi gēje ije nime ya, na ihe ayi gēme. 4 Jeremaia, bú onye-amuma, we si ha, Anuwom; le, m'gaje ikpere Jehova, bú Chineke-unu, ekpere, dika okwu nile nke unu si di; ọ gēru kwa na ihe ọ bula nke Jehova gāza unu, m'gēgosi unu ya; m'gaghi-eb͕ochinari unu ihe ọ bula. 5 Ndi ahu we si Jeremaia, Ka Jehova buru onye-àmà nēkwu ezi-okwu nke kwesi-kwa-ra ntukwasi-obi n'etiti ayi, ọ buru na ọ bughi dika okwu ahu nile si di, nke Jehova, bú Chineke-gi, gēzite gi ka i were ya biakute ayi, otú a ka ayi gēme. 6 Ma ọ di nma ma ọ jọrọ njọ, olu Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi gēge nti, bú Onye ayi onwe-ayi nēziga gi ijekuru; ka o we diri ayi nma, mb͕e ayi nēge nti olu Jehova, bú Chineke-ayi. 7 O rue, mb͕e ubọchi iri gwusiri, na okwu Jehova ruru Jeremaia nti. 8 O we kpọ Johanan nwa Karea, na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha so ya, na ndi Israel nile site n'onye dikarisiri ntà we rue onye dikarisiri uku, 9 si ha, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, Onye unu zigaram ijekuru ime ka aririọ-amara-unu da n'iru Ya, siri: 10 Ọ buru na unu ebiri n'ala nka, M'gēwu kwa unu dika ulo, ghara ikwada unu, M'gāku kwa unu dika osisi, ghara iropu unu: n'ihi na echeghariwom n'ihe ọjọ ahu nke M'meworo unu. 11 Unu atula egwu eze Babilon, onye unu onwe-unu nātu egwu ya; unu atula egwu ya, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): n'ihi na unu ka M'nọyere, izọputa unu, na inaputa unu n'aka-ya. 12 M'gēnye kwa unu ka enwe obi-ebere nile n'aru unu, ka o we nwe obi-ebere n'aru unu, me ka unu lata n'ala-unu. 13 Ma ọ buru na unu onwe-unu asi, Ayi agaghi-ebi n'ala nka; unu ewe ghara ige nti olu Jehova, bú Chineke-unu; 14 si, É-è; kama ọ bu n'ala Ijipt ka ayi gābà, ebe ayi nāgaghi-ahu agha, ayi agaghi-anu kwa olu opì-ike, agu ihe-oriri agaghi-agu kwa ayi; ọ bu kwa n'ebe ahu ka ayi gēbi: 15 ma ub͕u a n'ihi nka nurunu okwu Jehova, unu ndi Juda fọduru: otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri, Ọ buru na unu onwe-unu edosie iru-unu ike ibà n'Ijipt, unu ewe ba inọ dika ọbìa n'ebe ahu; 16 ọ gēru kwa, na mma-agha ahu nke unu onwe-unu nātu egwu ya, n'ebe ahu ka ọ gēru unu aru n'ala Ijipt; ọzọ, oké unwu ahu, nke unu onwe-unu nātu egwu ya, n'ebe ahu ka ọ gārapara unu n'aru n'iso unu n'azu n'Ijipt; ọ bu kwa n'ebe ahu ka unu gānwu. 17 Ọ bu kwa otú a ka ndikom ahu nile gādi, bú ndi doworo iru-ha ibà n'Ijipt inọ dika ọbìa n'ebe ahu; ha gānwu site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe: ha agaghi-enwe kwa ndi fọduru ma-ọbu ndi b͕apuru ab͕apu n'iru ihe ọjọ ahu nke Mu onwem nēme ka ọ biakwasi ha. 18 N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri; Dika awukwasiworo iwem na ọnumam n'aru ndi bi na Jerusalem, otú a ka agāwukwasi ọnumam n'aru unu, mb͕e unu batara n'Ijipt: unu gāghọ kwa ihe-ọb͕ub͕a-iyi, na ihe-iju-anya, na ihe-nkọcha, na ihe-ita-uta; ma unu agaghi-ahu kwa ebe a ọzọ. 19 Jehova ekwuwo okwu bayere unu, unu ndi Juda fọduru, si, Unu abàla n'Ijipt: maranu nke-ọma na ab͕aworom unu àmà ta. 20 N'ihi na unu akpafuwo megide nkpuru-obi-unu; n'ihi na unu onwe-unu zigaram jekuru Jehova, bú Chineke-unu, si, Kpere ayi Jehova, bú Chineke-ayi, ekpere; ọzọ, dika ihe nile si di nke Jehova, bú Chineke-ayi, gāsi, gi gosi ayi otú a, ayi gēme kwa ya: 21 m'we gosi unu ya ta; ma unu egeghi nti n'olu Jehova, bú Chineke-unu, ọbuná ime ihe ọ bula nke O zìrim ka m'were ya biakute unu. 22 Ma ub͕u a maranu nke-ọma na ọ bu site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe, ka unu gānwu n'ebe ahu nke ọ nātọ unu utọ ije nọ dika ọbìa n'ebe ahu.

Jeremaia 43

1 O rue, mb͕e Jeremaia gwabìri ndi Israel nile okwu nile nke Jehova, bú Chineke-ha, nke Jehova, bú Chineke-ha, zigara ya ka o were ha jekuru ha, bú okwu ndia nile, 2 Azaraia nwa Hoshaia, na Johanan nwa Karea, na ndi-nganga nile, we kwue, si Jeremaia, Okwu-ugha ka gi onwe-gi nēkwu: Jehova, bú Chineke-ayi, eziteghi gi isi, Unu abàla n'Ijipt inọ dika ọbìa n'ebe ahu: 3 kama Beruk nwa Neraia nākpali gi imegide ayi, ka o we nye ayi n'aka ndi Kaldea, ka ha we me ka ayi nwua, me kwa ka ayi je biri na Babilon. 4 Johanan nwa Karea, na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha, na ndi Israel nile, we ghara ige nti olu Jehova, ibi n'ala Juda. 5 Johanan nwa Karea, na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha, we chiri ndi Juda nile fọduru, bú ndi siri na mba nile ebe achugara ha-ri lata inọ dika ọbìa n'ala Juda; 6 bú ndikom, na ndinyom, na umu-ntakiri, na umu-ndinyom eze, na madu ọ bula nke Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ọ nọdu n'aka Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, na Jeremaia, bú onye-amuma, na Beruk nwa Neraia; 7 ha we ba n'ala Ijipt; n'ihi na ha egeghi nti olu Jehova: ha we biarue Tahpanhes. 8 Okwu Jehova we rue Jeremaia nti na Tahpanhes, si, 9 Were nkume di uku n'aka-gi, zobe ha n'urọ n'ebe ahu anākpu brick nke di n'ọnu-uzọ ulo Fero na Tahpanhes, n'anya ndi Juda; 10 si ha, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Le, M'gaje iziga kuru Nebukadreza, eze Babilon, bú orùm, dọkwasi oche-eze-ya n'elu nkume ndia nke m'zobeworo; ọ gēseti kwa ulo-ǹdò-ya n'elu ha. 11 Ọ gābia kwa, tib͕ue ala Ijipt; ndi diri ọnwu ka agēnye n'ọnwu, ndi diri ndọta-n'agha ka agēnye na ndọta-n'agha, ndi diri mma-agha ka agēnye na mma-agha. 12 M'gēsuye kwa ọku n'olu nile nke chi nile nke Ijipt; o gēsure kwa ha ọku, dọta ha n'agha: ọ gēji kwa ala Ijipt kpuchie onwe-ya dika onye-ọzùzù-aturu si eji uwe-ya kpuchie onwe-ya; o gēsi kwa n'ebe ahu pua n'udo. 13 O gētipia kwa ogidi nile nke ulo anyanwu, nke di n'ala Ijipt; ọ bu kwa ulo nile nke chi nile nke Ijipt ka ọ gēsure n'ọku.

Jeremaia 44

1 Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti bayere ndi-Ju nile ndi bi n'ala Ijipt, ndi bi na Migdol, na nime Tahpanhes, na nime Nof, na n'ala Patros, si, 2 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Unu onwe-unu ahuwo ihe ọjọ ahu nile nke M'meworo ka ọ biakwasi Jerusalem, biakwasi kwa obodo nile nke Juda; ma, le, ha bu nkpọnkpọ ebe ta, ọ dighi kwa onye bi nime ha; 3 n'ihi ihe ọjọ ha nke ha meworo ikpasum iwe, n'ije isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ifè chi ọzọ di iche iche, ndi ha nāmaghi, ha onwe-ha, ma-ọbu unu onwe-unu, ma-ọbu nna-unu-hà. 4 M'we zitere unu ndi-orùm nile, bú ndi-amuma, nēbili n'isi-ututu nēzite ha, si, Biko, unu emela ihe-árú a nke M'kpọworo asì. 5 Ma ha anughi, ha atọghi kwa nti-ha n'ala isi n'ihe ọjọ ha chigharia, ighara isurere chi ọzọ di iche iche ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ. 6 Ewe wusi ọnumam na iwem, o we re ọku n'obodo nile nke Juda, na n'èzí nile nke Jerusalem; ha we ghọ nkpọnkpọ ebe, ebe tọb͕ọrọ n'efu, dika o si di ta. 7 Ma ub͕u a otú a ka Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: N'ìhi gini ka unu onwe-unu nēme ihe ọjọ di uku megide nkpuru-obi unu, ibipu n'ulo-unu nwoke na nwanyi na nwatakiri na nwa nāṅu ara, ka ha pua n'etiti Juda, ewe me ka ọ ghara idi ndi fọduru gāfọduru unu; 8 n'iji ọlu nile nke aka-unu kpasuem iwe, n'isurere chi ọzọ di iche iche ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ala Ijipt, ebe unu onwe-unu biaworo inọ dika ọbìa; ka ewe bipu unu, ka unu we ghọ kwa ihe-nkọcha na ihe-ita-uta n'etiti mba nile nke uwa? 9 Ùnu echezọwo ihe ọjọ nile nke nna-unu-hà, na ihe ọjọ nile nke ndi-eze Juda, na ihe ọjọ nile nke ndinyom-ha, na ihe ọjọ nile nke unu, na ihe ọjọ nile nke ndinyom-unu, nke ha mere n'ala Juda, na n'èzí nile nke Jerusalem? 10 Azọpiaghi ha n'obi rue ta, ha atughi kwa egwu, ha ejegharighi kwa n'iwum, na n'ukpurum nile, nke M'tiyere n'iru unu na n'iru nna-unu-hà. 11 N'ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, ji si otú a: Le, M'gaje ido irum imegide unu ime unu ihe ọjọ, ọbuná ibipu Juda nile. 12 M'gēwere kwa ndi Juda fọduru, bú ndi doworo iru-ha ibà n'ala Ijipt inọ dika ọbìa n'ebe ahu, agēme kwa ka ha nile gwusia; n'ala Ijipt ka ha gāda; site na mma-agha na site n'oké unwu ka agēme ka ha gwusia: ha gānwu, site n'onye dikarisiri ntà we rue onye dikarisiri uku, site na mma-agha na site n'oké unwu: ha gāghọ kwa ihe-ọb͕ub͕a-iyi, na ihe-iju-anya, na ihe-nkọcha, na ihe-ita-uta. 13 M'gēji kwa nmehie nke ndi bi n'ala Ijipt leta ha, dika M'jiworo nmehie nke Jerusalem leta ya, site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe: 14 ọ gaghi-adi kwa onye-nb͕apu ma-ọbu onye fọduru afọdu ndi Juda fọduru gēnwe, bú ndi bataworo n'ala Ijipt inọ dika ọbìa n'ebe ahu, ọbuná ilaghachi n'ala Juda, nke ha onwe-ha nāchọ si-ike ilaghachi ibi n'ebe ahu: n'ihi na ọ dighi onye gālaghachi ma-ọbughi ndi b͕apuru ab͕apu. 15 Ndikom ahu nile ndi mara na ndinyom-ha nēsurere chi ọzọ di iche iche ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na ndinyom nile ndi nēguzo n'ebe ahu, ọ bu nkpọkọta di uku, ọbuná ndi Israel nile ndi bi n'ala Ijipt, nime Patros, ha we za Jeremaia, si, 16 Okwu ahu nke i gwaworo ayi n'aha Jehova, ayi agaghi-adi nēge gi nti. 17 Kama ayi aghaghi ime okwu nile ọ bula nke puworo n'ọnu-ayi, isurere eze-nwanyi nke elu-igwe ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na iwusiri ya àjà-ihe-ọṅuṅu, dika ayi meworo, ayi onwe-ayi, na nna-ayi-ha, na ndi-eze-ayi, na ndi-isi-ayi, n'obodo nile nke Juda, na n'èzí nile nke Jerusalem: ayi we rijue nri afọ, aru adi ayi nma, ọ dighi kwa ihe ọjọ ayi huru. 18 Ma site na mb͕e ayi rapuru isurere eze-nwanyi nke elu-igwe ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na iwusiri ya àjà-ihe-ọṅuṅu, ihe nile akọwọ ayi, ọ bu kwa site na mma-agha na site n'oké unwu ka emeworo ka ayi gwusia. 19 Ma mb͕e ayi onwe-ayi nēsurere eze-nwanyi nke elu-igwe ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, nāwusi-kwa-ra ya àjà-ihe-ọṅuṅu, ọ̀ bu mb͕e di-ayi nēkweghi ka ayi meworo ob͕e achicha nye ya ime onyinyo-ya, wusi-kwa-ra ya àjà-ihe-ọṅuṅu? 20 Jeremaia we gwa ndi Israel nile, ma ndikom ma ndinyom, ọbuná ndi Israel nile ndi nāza ya okwu, si, 21 Ọ̀ bughi ihe-nsure-ọku ahu nēsì ísì utọ nke unu surere n'obodo nile nke Juda na n'èzí nile nke Jerusalem, unu onwe-unu, na nna-unu-hà, na ndi-eze-unu, na ndi-isi-unu, na ndi ala ahu, ọ̀ bughi ihe ndia ka Jehova chetara, ihe ahu we bata n'obi-Ya? 22 Jehova apughi kwa inagide kwa ọzọ, n'ihi ihe ọjọ nke omume nile unu, n'ihi ihe-árú nile nke unu meworo; ala-unu we ghọ nkpọnkpọ ebe, na ihe-iju-anya, na ihe-nkọcha, ghara inwe onye-obibi, dika o si di ta. 23 N'ihi na unu esurewo ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na n'ihi na unu emehiewo megide Jehova, we ghara ige nti olu Jehova, ghara kwa ijeghari n'iwu-Ya, na n'ukpuru-Ya nile, na n'ihe-àmà-Ya nile; n'ihi nka ka ihe ọjọ a dakwasiworo unu, dika o si di ta. 24 Jeremaia we si ndi Israel nile, si kwa ndinyom ahu nile, Nurunu okwu Jehova, unu Juda nile ndi nọ n'ala Ijipt: 25 otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, kwuru, si: Unu onwe-unu na ndinyom-unu ji ọnu-unu ekwu okwu, ọ bu kwa aka-unu ka unu jiworo mezu ya, si, Ayi aghaghi ime nkwa nile ayi nke ayi kweworo, isurere eze-nwanyi nke elu-igwe ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na iwusiri ya àjà-ihe-ọṅuṅu: menu ka nkwa nile unu guzosie ike n'ezie, me-kwa-nu ihe nile unu kwere na nkwa n'ezie. 26 N'ihi nka nurunu okwu Jehova, unu Juda nile ndi bi n'ala Ijipt: Le, Mu onwem ewerewo aham di uku ṅua iyi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na aham agaghi-abu kwa ọzọ ihe anākpọ n'ọnu onye ọ bula nke Juda n'ala Ijipt nile, si, Onye-nwe-ayi Jehova nādi ndu. 27 Le, Mu nāmu anya n'aru ha ime ha ihe ọjọ, ọ bughi ime ha nma: agēme kwa ka ndi Juda nile, bú ndi nọ n'ala Ijipt, gwusia site na mma-agha na site n'oké unwu, rue mb͕e ha gāgwusi. 28 Ma ndi b͕apuworo na mma-agha gēsi n'ala Ijipt laghachi n'ala Juda, ndikom ole-na-ole; ndi Juda nile fọduru, bú ndi biaruworo ala Ijipt inọ dika ọbìa n'ebe ahu, ewe mara onye okwu-ya gēguzosi ike, nkem, ma-ọbu nke ha. 29 Ma nka gāburu unu ihe-iriba-ama, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na Mu onwem nēji nmehie-unu leta unu n'ebe a, ka unu we mara na okwum nile aghaghi iguzosi ike imegide unu ime unu ihe ọjọ: 30 otú a ka Jehova siri: Le, M'gaje inye Fero Họfra, bú eze Ijipt, n'aka ndi-iro-ya, na n'aka ndi nāchọ ndu-ya; dika M'nyere Zedekaia, bú eze Juda, n'aka Nebukadreza, bú eze Babilon, bú onye-iro-ya, nke nāchọ kwa ndu-ya.

Jeremaia 45

1 Okwu ahu nke Jeremaia, bú onye-amuma, gwara Beruk nwa Neraia, mb͕e o dere okwu ndia n'akwukwọ site n'ọnu Jeremaia, n'arọ nke-anọ nke Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, si, 2 Okwu di otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, kwuru bayere gi, Beruk, si: 3 I siri, Biko, ahuhu nādirim! n'ihi na Jehova atukwasiwo ihe-nwuta n'elu ihe-nb͕um; adọb͕uwom onwem n'ọlu n'ize-umem, ma achọtaghm izu-ike. 4 Otú a ka i gāsi ya, Otú a ka Jehova siri: Le, ihe nke M'wuworo ka Mu onwem nākwada, ọzọ, ihe nke M'kuworo n'ubi ka Mu onwem nēropu; ọbuná ala nka nile, nkem ka ọ bu. 5 Ma gi onwe-gi, ì nāchọrọ onwe-gi ihe uku? achọla ha: n'ihi na, le, M'gaje ime ka ihe ọjọ biakwasi anu-aru nile, bú madu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): ma M'gēnye gi ndu-gi ka ọ buru ihe-nkwata n'ebe nile i gēje.

Jeremaia 46

1 Okwu Jehova nke ruru Jeremaia, bú onye-amuma, nti bayere mba nile. 2 Nke diri Ijipt: bayere usu-ndi-agha nke Fero-neko, bú eze Ijipt, nke di n'akuku osimiri Yufretis nime Kakemish, nke Nebukadreza, bú eze Babilon, tib͕uru n'arọ nke-anọ nke Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda. 3 Donu ọta na ọta uku n'usoro, biaru-kwa-nu nso ibu agha. 4 Kegidenu inyinya n'ub͕ọ-ala, rikwasinu, unu ndi-inyinya, guzo-kwa-nu onwe-unu nēkpu okpu-agha; richanu ube-unu, yirinu uwe-agha-unu. 5 Gini mere m'huworo ya? ndi ahu nātu ujọ b͕aghachi azu; anētipia kwa ndi-dike-ya, ha ab͕alagawo kwa ngwa ngwa, we ghara ile anya n'azu: egwu di buruburu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 6 Ka onye nwere ukwu ọsọ ghara ib͕alaga, ka dike ghara kwa iwepuga onwe-ya; n'Ugwu n'akuku osimiri Yufretis ka ha suru ngọngọ, da. 7 Ònye bu onye a? dika osimiri Nail ka ọ nērú, dika osimiri ka miri-ya nile nāmaghari. 8 Ijipt nērú dika osimiri Nail, ọ bu kwa dika osimiri ka miri-ya n'amaghari: o we si, M'gārigo, kpuchie uwa; m'gēme ka obodo na ndi bi nime ya la n'iyì. 9 Rigonu, unu inyinya; kpọtuanu nkpọtu, unu ub͕ọ-ala; ka ndi-dike puta kwa: Kush na Put, ndi nēji ọta; na Ludim, ndi nēji nāzọ kwa uta ukwu ikwe ya. 10 Ma ubọchi ahu diri Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, ọ bu ubọchi ibọ̀-ọ́bọ̀, ka O we bọ̀rọ Onwe-ya ndi nēmegide Ya ọ́bọ̀: mma-agha gēripia kwa, afọ eju kwa ya, ọ gāṅuju kwa ọbara-ha afọ: n'ihi na àjà ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nwere n'ala Ugwu n'akuku osimiri Yufretis. 11 Rigorue Gilead, nara balm, gi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú ada Ijipt: n'efu ka i meworo ka ọgwu ba uba; ọ dighi ọgwu-ntechi i nwere. 12 Mba nile anuwo ihere-gi, iti-nkpu-gi juputa-kwa-ra uwa: n'ihi na dike asukwasiwo dike ngọngọ, n'otù ka ha dakọworo, ha abua. 13 Okwu ahu nke Jehova gwara Jeremaia, bú onye-amuma, bayere ọbibia nke Nebukadreza, bú eze Babilon, itib͕u ala Ijipt. 14 Gosinu n'Ijipt, menu ka anuru ya na Migdol, me-kwa-nu ka anuru nime Nof na nime Tahpanhes: sinu, Guzo onwe-gi, dozi-kwa-ra onwe-gi; n'ihi na mma-agha eripiawo buruburu gi. 15 Gini mere eji zachapu onye nke gi di ebube? o guzoghi, n'ihi na Jehova kwaturu ya. 16 O mere ka ndi nāsu ngọngọ di ọtutu, e, otù onye dakwasiri ibe-ya: ha we si, Bilie, ka ayi laghachikuru ndi-ayi, laghachi kwa n'ala amuru ayi, pua n'iru mma-agha nēme ihe-ike. 17 Ha kpọrọ nkpu n'ebe ahu, si, Fero, bú eze Ijipt, bu nání nkpọtu; o kwerewo ka mb͕e akara àkà gabiga. 18 Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Eze ahu puta, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya), n'ezie dika Teboa n'etiti ugwu nile, na dika Kamel n'akuku oké osimiri, otú a ka ọ gābia. 19 Mere onwe-gi ihe nile iji je biri n'ala ọzọ, gi ada nēbi n'Ijipt: n'ihi na Nof gāghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, esuresiwo kwa ya ọku, o we ghara inwe onye-obibi. 20 Nwa-ab͕ọghọ-ehi mara nma nke-uku ka Ijipt bu; odudo nke sitere n'Ugwu abiawo, ọ biawo. 21 Ọzọ, ndi-ya egoro agha ndi nọ n'etiti ya di ka umu-ehi nke ulo ebe anēme ka anu ma abuba; n'ihi na ha onwe-ha elewo anya n'azu, ha ab͕alagawo n'otù, ha eguzogh: n'ihi na ubọchi nhuju-anya-ha abiakwasiwo ha, bú mb͕e nleta-ha. 22 Olu-ya di ka mkpatu agwọ mb͕e ọ nāga; n'ihi na ha gāchiri usu-ndi-agha je ije, ha achiriwo kwa anyu-ike biakute ya, dika ndi-ọwa-nkú. 23 Ha gēb͕utu oké ọhia-ya, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), n'ihi na agaghi-eleputa ya; n'ihi na ha di ọtutu kari igurube, ha adighi kwa ọnu-ọgugu. 24 Agēme ka ihere me ada Ijipt; agēnye ya n'aka ndi Ugwu. 25 Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Le, M'gaje iji nmehie-ha leta Amon nke No, leta kwa Fero, leta kwa Ijipt, leta kwa chi-ya nile, leta kwa ndi-eze-ya; ọbuná Fero, na ndi nātukwasi ya obi: 26 M'gēnye kwa ha n'aka ndi nāchọ ndu-ha, na n'aka Nebukadreza, bú eze Babilon, na n'aka ndi-orù-ya: ma emesia agēbi ya, dika o si di n'ubọchi nile nke mb͕e ochie; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 27 Ma gi onwe-gi, atula egwu, gi orùm, bú Jekob, atu-kwa-la ujọ, gi Israel: n'ihi na, le, M'gaje izọputa gi n'ebe di anya, zọputa kwa nkpuru-gi n'ala ọzọ ebe emere ka ha je biri; Jekob gālata kwa, nọ jū n'aru mgbū, ọ dighi kwa onye ganēme ka ọ ma jijiji. 28 Gi onwe-gi atula egwu, gi orùm, bú Jekob, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); n'ihi na gi ka M'nọyere: n'ihi na M'gēme ka mba nile gwusia, bú ebe M'chugaworo gi, ma gi ka M'nāgaghi-eme ka i gwusia: ma M'gādọ gi aka na nti n'ikpé, M'gaghi-asi kwa na i bu onye ikpe nāmaghi ma-ọli.

Jeremaia 47

1 Okwu Jehova nke ruru Jeremaia, bú onye-amuma, nti bayere ndi Filistia, tutu Fero etib͕ue Geza. 2 Otú a ka Jehova siri: Le, miri nēsi n'Ugwu erú, ha gāghọ kwa miri-iyi nērubiga ókè, ha gērusa kwa ala na ùjú-ya, na obodo na ndi bi nime ya: madu ewe tie nkpu, ndi nile bi n'ala ahu gākwasi kwa ákwá ike. 3 Site n'olu ọzuzọ nke ukwu inyinya-ya nile di ebube, site na nkpọtu ub͕ọ-ala-ya, na ùzù nke wheel-ya nile, ndi bu nna eleghi anya n'azu ilekwasi umu-ha n'ihi aka kudara akuda; 4 n'ihi ubọchi ahu nke nābia ipunara ndi Filistia nile ihe-ha, ibipu na Taia na ibipu na Zaidon onye-iye-aka ọ bula nke fọduru: n'ihi na Jehova nāpunara ndi Filistia ihe, bú ndi agwe-etiti Kaftoa fọduru. 5 Nkwọcha-isi abiakwasiwo Geza; emewo ka Ashkelon dere du, bú ndi ndagwurugwu-ha fọduru: rùe ole mb͕e ka i gēbì onwe-gi mma? 6 A, gi mma-agha Jehova nwere, rùe ole mb͕e ka i gāghara idi jū? miye onwe-gi n'ọbọ-gi; doro aru ala, dere du. 7 Ì gesi aṅa di jū, ebe Jehova nyeworo gi iwu? imegide Ashkelon, na imegide ọnu-miri nke oké osimiri, n'ebe ahu ka Ọ kaworo ya.

Jeremaia 48

1 Nke diri Moab. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Ahuhu diri Nebo! n'ihi na emebiwo ya; emewo ka ihere me Kiriataim, ewerewo ya: emewo ka ihere me Misgab, ọ nātu kwa ujọ. 2 Ọ dighi kwa otuto Moab di ọzọ; nime Heshbon ka ha chèputara èchìchè ọjọ megide ya, si, Bianu, ka ayi bipu ya ka ọ ghara ibu mba. Gi Madmen, agēme kwa ka i dere du; gi ka mma-agha gējeso. 3 Ge nti olu iti-nkpu nke siri na Horonaim puta, ọ bu ipunara-madu-ihe na ntikpọ uku! 4 Etikpọwo Moab; ndi-ntà-ya emewo ka anuru iti-nkpu. 5 N'ihi na nrigo Luhit ka o ji ikwa-ákwá nārigo nākwa ákwá; n'ihi na nime nrida Horonaim ka ha nuworo nkpà nke iti-nkpu nke ntikpọ. 6 B͕alaganu, wepuganu onwe-unu, di-kwa-nu ka osisi tamarisk n'ọzara. 7 N'ihi na ọ bu n'ihi na i tukwasiwo obi-gi n'ọlu-gi nile na n'àkù-gi nile ka agēwere kwa gi onwe-gi: Kemosh gāpu kwa so ndi gēje biri n'ala ọzọ, na ndi-nchu-àjà-ya na ndi-isi-ya n'otù. 8 Onye nāpunara madu ihe gābiaru kwa obodo nile ọ bula, ọ dighi kwa obodo ọ bula gēwepuga onwe-ya; ndagwurugwu gāla kwa n'iyì, agēme kwa ka ala di lari tọb͕ọrọ n'efu; dika Jehova siri. 9 Nyenu Moab nkù, n'ihi na ọ ghaghi ifepu efepu: obodo-ya nile gāghọ kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu, ghara inwe onye bi nime ha. 10 Onye anābu ọnu ka onye nke ji aghughọ eje ozi Jehova bu, onye anābu ọnu ka onye nke nēb͕opu mma-agha-ya n'ọbara bu kwa. 11 Onye nānọ jū ka Moab bu site na mb͕e ọ di na nwata, ọzọ, manya-vine doro edo ka ọ bu, esighi kwa n'otù ihe b͕aye ya n'ihe ọzọ, o jeghi kwa n'etiti ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ: n'ihi nka ka utọ-ya guzoworo nime ya, ísì-ya ab͕anweghi kwa. 12 N'ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gēzigara ya ndi nērulata ite manya-vine, ha ewe rulata ya; ọ bu kwa ihe manya-vine ya nile ka ha gāb͕apu, ọ bu kwa ite nile ha ka ha gātupia. 13 Ihere Kemosh gēme kwa Moab, dika ihere Bet-el, bú ihe-ntukwasi-obi-ha, mere ulo Israel. 14 Ùnu si aṅa si, Ndi-dike ka ayi bu, na ndi bu dìnkpà ibu agha? 15 Emebiwo Moab, obodo-ya nile akwugowo kwa n'anwuru-ọku umu-okorọbia-ya arọputara arọputa aridawo kwa n'ob͕ub͕u, ọ bu ihe si n'ọnu Eze ahu puta, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya. 16 Nhuju-anya Moab di nso ibia, ihe ọjọ ya nēme kwa ngwa nke-uku. 17 Gosinu ya ebere unu nwere n'aru ya, unu ndi nile ndi nọ ya buruburu, na unu nile ndi mara aha-ya; sinu, Èsi aṅa b͕aji nkpa-n'aka di ike, bú ndele mara nma? 18 Si na nsọpuru-gi rida, nọdu ala n'akpiri-ikpọ-nku, gi ada nke bi na Dibon; n'ihi na onye nāpunara Moab ihe-ya arigowo imegide gi, o biliwo ebe-gi nile ewusiri ike. 19 Guzo n'uzọ, che nche, gi nwanyi bi n'Aroa: jua onye nāb͕alaga na nwanyi nke nēwepuga onwe-ya; si, Gini mere? 20 Emewo ka ihere me Moab; n'ihi na ọ tuwo ujọ: kwasie ákwá ike ti kwa nkpu; gosinu ya n'Anon, na emebiwo Moab. 21 Ikpé abiaruwo kwa ala nke bu ala di lari; rue Holon, ru kwa Jahza, ọ biakwasiwo kwa Mefaat; 22 biakwasi kwa Dibon, biakwasi kwa Nebo, biakwasi kwa Bet-diblataim; 23 biakwasi kwa Kiriataim, biakwasi kwa Bet-gamul, biakwasi kwa Bet-meon; 24 biakwasi kwa Keriot, biakwasi kwa Bọzra, biakwasi kwa obodo nile nke ala Moab, nke di anya ma-ọbu nke di nso. 25 Ebipuwo mpi Moab, ab͕ajiwo kwa ogwe-aka-ya, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta). 26 Menu ya ka ọ ṅubiga manya ókè; n'ihi na ọ bu Jehova ka o mere onwe-ya ka ọ di uku megide: Moab gāturu kwa onwe-ya n'ihe ọ b͕ọrọ, ọ gāghọ kwa ihe-ọchì, ọbuná ya onwe-ya. 27 N'ihi na Israel, ọ̀ bughi ihe-ọchì ọ buru gi? ọ̀ bu n'etiti ndi-ori ka achọtara ya? n'ihi na ka mb͕e ra i nēkwu okwu bayere ya, i nēfufe isi-gi. 28 Rapunu obodo nile, we biri na nkume di elu, unu ndi bi na Moab; di-kwa-nu ka nduru nke nālu akwu-ya n'ofè ọnu olùlù. 29 Ayi anuwo ihe bayere npako Moab, na ọ nāpako npako nke-uku; ọbuná ihe bayere idi-elu-ya, na npako-ya, na nganga-ya, na nbuli-elu nke obi-ya. 30 Mu onwem mara nrubiga-ókè-iwe-ya, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na ihe nēzighi ezi ka ọ bu; ekwukwu-ya nile, ihe nēzighi ezi ka ha meworo. 31 N'ihi nka ka m'gākwasiri Moab ákwá ike; e, ọ bu Moab nile ka m'gētiri nkpu: bayere ndi Kia-heres ka agātamu ntamu. 32 Ákwá nke kariri ákwá Jeza ka m'gākwara gi, gi osisi vine nke Sibma: alaka-gi nile gabigara oké osimiri, ọbuná n'oké osimiri nke Jeza ka ha ruru: n'elu nghọkọta-nkpuru-gi na n'elu nghọrọ-nkpuru-vine-gi ka onye nke nāpunara madu ihe daworo. 33 Ewepuwo kwa ọṅù na iteghari-egwú-ọṅù n'ubi ọma na n'ala Moab; emewokwam ka manya-vine kwusi n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine nile: ọ dighi onye gēji iti-nkpu nzọcha-nkpuru-vine zọcha nkpuru-vine; iti-nkpu nzọcha-nkpuru-vine agaghi-abu iti-nkpu nzọcha-nkpuru-vine. 34 Site n'iti-nkpu Heshbon rue Eleale, rue Jehez ka ha mere ka olu-ha da, site na Zoa rue Horonaim, rue Eglat-shelishiya: n'ihi na ọbuná miri Nimrim gāghọ nání ebe tọb͕ọrọ n'efu. 35 M'gēme kwa ka ọ kwusiri Moab, bú onye nēsure àjà-nsure-ọku n'ebe di elu, na onye nēsurere chi di iche ya ihe-nsure-ọku nesì ísì utọ; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 36 N'ihi nka obim nādara Moab udà dika ọ̀jà, obim nāda-kwa-ra ndi Kia-heres udà dika ọ̀jà: n'ihi nka ihe o nwebigara ókè nke o nwetara alawo n'iyì. 37 N'ihi na isi nile ọ bula kwọchara akwọcha, ọ bu kwa afu-ọnu nile ọ bula ka ebipuworo: n'aka nile ka obibì-mma dikwasi, n'úkwù nile ka ákwà-nkpe di kwa. 38 N'elu-ulo nile nke Moab na n'amá-ya nile, n'ebe nile ọ bula, ka iti-aka-n'obi di: n'ihi na etiwawom Moab dika ihe nātọghi utọ; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 39 Le ka esi tipia ya nke-uku! ha akwasiwo ákwá ike. Le ka Moab si b͕akuta azu n'ihere nke-uku! Moab aghọwo-kwa-ra ndi nile di ya buruburu ihe-ọchì na ihe-itu-ujọ. 40 N'ihi na otú a ka Jehova siri: Le, dika ugo ka ọ gēfesi ike, b͕asa nkù-ya abua rue Moab. 41 Ewerewo Keriot, anarawo kwa ebe nile ewusiri ike, obi ndi-dike Moab n'ubọchi ahu gādi kwa ka obi nwanyi ime nēme. 42 Agēkpochapu kwa Moab ka ọ ghara ibu otù ndi, n'ihi na ọ bu imegide Jehova ka ọ meworo onwe-ya ka ọ di uku. 43 Oké egwu na olùlù na ib͕udu nādikwasi gi, gi onye bi na Moab; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 44 Onye ahu nke nāb͕apu n'iru oké egwu ahu gādabà n'olùlù ahu; ọzọ, onye ahu nke nārigoputa n'òlùlù ahu, agējide ya n'ib͕udu ahu: n'ihi na M'gēme ka arọ nleta-ha biakute ya, bú Moab; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 45 N'okpuru ndò Heshbon ka ndi nāb͕alaga guzoworo nēnweghi ike: n'ihi na ọku esiwo na Heshbon pua, na ire-ọku site n'etiti Saihon, o we ripia akuku Moab, na opu-n'isi nke umu nkpọtu. 46 Ahuhu diri gi, Moab! ndi Kemosh alawo n'iyì: n'ihi na achiriwo umu-gi ndikom la na ndọta-n'agha, achiriwo kwa umu-gi ndinyom la na ndọta-n'agha. 47 Ma M'gēme ka ndi Moab adọtara n'agha laghachi n'ikpe-azu nke ubọchi nile; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Rue ebe a bu ikpé Moab.

Jeremaia 49

1 Nke diri umu Amon. Otú a ka Jehova siri: Ọ̀ dighi umu-ndikom Israel nwere? ọ̀ dighi onye-nnweta ihe-ya o nwere? Gini mere Malkam ji nweta Gad, ndi-ya we biri n'obodo-ya nile? 2 N'ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gēme ka anuru udà-opì agha rue Raba nke umu Amon; ọ gāghọ kwa obo ebe tọb͕ọrọ n'efu, ọ bu kwa umu-ya ndinyom ka agēji ọku sure: Israel ewe nweta ndi nwetara ya-ri; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 3 Kwasie ákwá ike, gi Heshbon, n'ihi na apunarawo Ai ihe-ya; tienu nkpu, unu umu-ndinyom nke Raba, kenu ákwà-nkpe n'úkwù: tienu aka n'obi, b͕aghari-kwa-nu n'ogige nile unu; n'ihi na Malkam gāla n'etiti ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ya na ndi-nchu-àjà-ya na ndi-isi-ya n'otù. 4 Gini mere i ji ndagwurugwu nile anya isi? ndagwurugwu-gi nērùpu dika miri, gi ada nke nādaghachi azu, nke nātukwasi obi n'àkù-ya nile, si, Ònye gābiakutem? 5 Le, M'gaje ime ka oké egwu biakwasi gi, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, puta), site na ndi nile nọ gi buruburu; agāchupu kwa unu, onye ọ bula n'iru ya, ọ gaghi-adi kwa onye nāchikọta onye ọ bula nāwaghari. 6 Ma emesia M'gēme ka umu Amon adọtara n'agha laghachi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 7 Nke diri Edom. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Amam-ihe, ọ̀ dighi kwa na Timan ọzọ? ndum-ọdu, ọ̀ lanariwo ndi-nghọta n'iyì? amam-ihe-ha, àwusiwo ya? 8 B͕alaganu, chigharia, biri n'ebe di omimi, unu ndi bi na Dedan; n'ihi na nhuju-anya Isọ ka M'gēme ka ọ biakwasi ya, mb͕e M'gēleta ya. 9 Ọ buru na ndi nāghọrọ nkpuru-vine abiakute gi, hà agaghi-aghọfọ nkpuru nke fọduru itutukọ? ọ buru na ndi-ori abia n'abali, hà agaghi-ebibi nke gēzuru ha? 10 N'ihi na Mu onwem ab͕abawo Isọ ọtọ, ekpughepuwom ebe-nzuzo-ya nile, ọ pughi kwa izobe onwe-ya: apunariwo nkpuru-ya na umu-nne-ya na ndi-ab͕ata-obi-ya ihe-ha, ọ dighi kwa ndu. 11 Rapu umu-nb͕ei-gi, Mu onwem gēdebe ha ndu; ka ndinyom-i di-ha nwuru tukwasim obi-ha. 12 N'ihi na otú a ka Jehova siri: Le, ndi anēkpeghi ikpe iṅu n'iko ahu aghaghi iṅu; ma gi onwe-gi, ì gābu kwa onye ahu nke anāmaghi ikpe ma-ọli? I gaghi-abu onye anāmaghi ikpe, n'ihi na i ghaghi iṅu. 13 N'ihi na Onwem ka M'jiri ṅu iyi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na ihe-iju-anya na ihe-ita-uta na nkpọnkpọ ebe na ihe-nkọcha ka Bọzra gāghọ; obodo-ya nile gāghọ kwa nkpọnkpọ ebe mb͕e ebighi-ebi. 14 Akukọ ka m'nuworo sitere na Jehova, ọ bu kwa ukọ̀ ka ezigaworo n'etiti mba nile, si, Chikọtanu onwe-unu, bia imegide ya, bili-kwa-nu ibu agha. 15 N'ihi na, le, mba di ntà ka M'meworo gi n'etiti mba nile, bú ihe-nlelì n'etiti madu. 16 Idi-egwu-gi, nganga nke obi-gi arafuwo gi, gi onye bi na nb͕awa nile nke nkume ahu di elu, onye nējide ebe di elu nke ugwu ntà: n'ihi na asi na i me akwu-gi ka ọ di elu dika nke ugo, M'gēme ka i si n'ebe ahu ridata; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 17 Edom gāghọ kwa ihe-iju-anya: o gēju onye ọ bula nke nāgabiga n'akuku ya anya, ọ gāma kwa ọsọ n'ihi ihe-otiti-ya nile. 18 Dika nkwatu nke Sọdọm na Gọmọra na ab͕ata nile ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ọ dighi onye ọ bula gēbi n'ebe ahu, nwa madu ọ bula agaghi-anọ kwa dika ọbìa nime ya. 19 Le, dika ọdum ka ọ nārigo, bú nke si na nbili-elu nke Jọdan arigo, rue ebeita-nri nādigide mb͕e nile: ma n'otù ntabi-anya ka M'gēme ka o si n'aru-ya b͕a ọsọ; ma ònye bu onye arọputara arọputa? onye-nlekọta-ya ka M'gēme ya: n'ihi na ònye di kam? ọ̀ bu kwa onye gākaram mb͕e? ma-ọbu ònye bu kwa onye-ọzùzù-aturu a nke gēguzo n'irum? 20 N'ihi nka nurunu ndum-ọdu Jehova, nke Ọ duworo megide Edom; na èchìchè-Ya nile, nke O chèworo megide ndi bi na Timan, si: N'ezie ha gādọkpupu ha, bú ndi ntà nke ìgwè ewu na aturu; n'ezie o gēju ebe-ita-nri-ha anya bayere ha. 21 Site n'olu nke ọdida-ha uwa mara jijiji; iti-nkpu di, n'Oké Osimiri Uhie ka anuru olu-ya. 22 Le, dika ugo ka ọ gārigo, fesie ike, b͕asa nkù-ya n'elu Bọzra: obi ndi-dike Edom n'ubọchi ahu gādi kwa ka obi nwanyi ime nēme. 23 Nke diri Damaskọs. Ihere emewo Hemat na Apad; n'ihi na akukọ ọjọ ka ha nuworo, ha ab͕azewo: n'oké osimiri ka ncheb͕u di; ọ pughi inọ jū. 24 Damaskọs aghọwọ onye-ume-ngwu, o lewo anya n'azu ib͕alaga, ọma-jijiji ejidewo kwa ya: nkpà na ihe-nb͕u di iche iche ejidesiwo kwa ya ike, dika nke nwanyi ime nēme. 25 Èsi aṅa ghara irapu obodo nke otuto, bú obodo nke obi-utọm? 26 N'ihi nka ka umu-okorọbia-ya gāda n'amá-ya nile, ọ bu kwa ndi-agha-ya nile ka agēme ka ha dere du n'ubọchi ahu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 27 M'gēsuye kwa ọku na mb͕idi Damaskọs, ọ gēripia kwa ulo nile di elu nke Ben-hedad. 28 Nke diri Kida, di-kwa-ra ala-eze nile nke Hezoa, nke Nebukadreza, bú eze Babilon, tib͕uru. Otú a ka Jehova siri: Bilienu, rigorue Kida, punara umu Iru-anyanwu ihe-ha. 29 Ulo-ikwū nile ha na ìgwè ewu na aturu-ha ka ha gāchiri; ákwà-nkwuba nile ha na ihe nile ha na camel nile ha ka ha gēbupuru onwe-ha: ha gākpọ nkpu bayere ha, si, Ujọ di buruburu. 30 B͕alaganu, wagharia nke-uku, biri n'ebe di omimi, unu ndi bi na Hezoa, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); n'ihi na Nebukadreza, bú eze Babilon, aduwo ọdu megide unu, ọ chèwo kwa èchìchè megide unu. 31 Bilienu, rigorue mba nke nọ n'udo, nke bi na ntukwasi-obi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); nke nēnweghi ọnu-uzọ ma-ọbu ihe-ntuchi, nání ha nēbi. 32 Camel nile ha gāghọ kwa ihe-nluta-n'agha, ìgwè anumanu-ha gāghọ kwa ihe-nkwata: M'gēfesa-kwa-ra ifufe nile ndi akọpuworo usọ isi-ha; ọ bu kwa n'ofè-ya nile ka M'gēme ka nhuju-anya-ha si bia; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 33 Hezoa gāghọ kwa ebe-obibi nkita-ọhia, bú ebe tọb͕ọrọ n'efu rue mb͕e ebighi-ebi: ọ dighi onye ọ bula gēbi n'ebe ahu, nwa madu ọ bula agaghi-anọ kwa dika ọbìa nime ya. 34 Okwu Jehova nke ruru Jeremaia, bú onye-amuma, nti bayere Ilam na mb͕e mbu nke ọbubu-eze nke Zedekaia, bú eze Juda, si, 35 Otú a ka Jehova nke usu nile ndi-agha siri: Le, M'gaje ib͕aji uta Ilam, bú isi ihe nke idi-ike-ha. 36 M'gēme kwa ka ifufe anọ si na nsọtu anọ nke elu-igwe biakute Ilam, M'gēfesa kwa ha nye ifufe nile ndia; ọ gaghi-adi kwa mba ọ bula ebe ndi Ilam achugara achuga nāgaghi-abà. 37 M'gēme kwa ka Ilam tua ujọ n'iru ndi-iro-ha na n'iru ndi nāchọ ndu-ha: M'gēme kwa ka ihe ọjọ biakwasi ha, bú iwe di ọku nkem, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); M'gēziga kwa mma-agha n'azu ha, rue mb͕e M'mere ka ha gwusia: 38 M'gēdo kwa oche-eze nkem n'Ilam, M'gēme kwa ka eze na ndi-isi si n'ebe ahu la n'iyì; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 39 Ma o gēru, n'ikpe-azu nke ubọchi nile, na M'gēme ka ndi Ilam adọtara n'agha laghachi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

Jeremaia 50

1 Okwu ahu nke Jehova kwuru bayere Babilon, bayere ala ndi Kaldea, site n'aka Jeremaia, bú onye-amuma. 2 Gosinu n'etiti mba nile, menu ka anuru ya, bulienu ọkọlọtọ; menu ka anuru ya, unu ezobela: sinu, Ewerewo Babilon, emewo ka ihere mee Bel, Merodak atuwo ujọ; emewo ka ihere me arusi-ya nile akpuru akpu, arusi-ya nile atuwo ujọ. 3 N'ihi na otù mba esiwo n'Ugwu rigoputa imegide ya, mba ahu gēme ka ala-ya ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ọ dighi kwa onye ganēbi nime ya: ma madu ma anumanu, ha awaghariwo, la. 4 N'ubọchi ahu, na na mb͕e ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), umu Israel gābia, ha onwe-ha na umu Juda n'otù; ha ganēje ije nākwa ákwá, ọ bu kwa Jehova, bú Chineke-ha, ka ha gāchọ. 5 Ha gāju ajuju uzọ isi je Zaion, nēche iru-ha n'ebe a, si, Bianu, were onwe-unu rapara n'aru Jehova n'ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi nke anāgaghi-echezọ echezọ. 6 Ìgwè ewu na aturu nāla n'iyì ka ndim buworo: ndi-ọzùzù-aturu-ha emewo ka ha kpafue, n'ugwu di iche iche ka ha meworo ka ha laghachi azu: site n'ugwu rue ugwu ntà ka ha jeworo, ha echezọwo ebe-nmakpu-ha. 7 Ndi nile ndi nāchọputa ha eripiawo ha: ndi nākpab͕u ha siri, Ikpe amaghi ayi, n'ihi na ha emehiewo megide Jehova, bú ebe-obibi nke ezi omume, na olile-anya nke ndi bu nna-ha, bú Jehova. 8 Sinu n'etiti Babilon wagharia, si-kwa-nu n'ala ndi Kaldea pua, di-kwa-nu ka nkpi n'iru ìgwè ewu na aturu. 9 N'ihi na, le, Mu onwem gaje ikpọte me ka nkpọkọta mba uku di iche iche si n'ala Ugwu rigoputa imegide Babilon: ha gēdo kwa onwe-ha n'usoro megide ya; agēsi n'ebe ahu were ya: àkú nke usu ahu gādi ka nke dike nke bu ọ̀kà-uta; ọ gaghi-alaghachi azu n'efu. 10 Kaldea gāghọ kwa ihe-nkwata: afọ gēju ndi nile ndi nākwata ya; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 11 N'ihi na unu nāṅuri ọṅu, n'ihi na unu nāṅuri ọṅu-agha, unu ndi nāpunara ihe-nketam ihe, n'ihi na unu nāwuli elu dika nwa-ab͕ọghọ-ehi nke nāzọcha ọka, unu nēbe kwa dika inyinya di ike; 12 ihere gēme nne-unu nke-uku; nwanyi nke muru unu gēnwe iru-ihere: le, ọ gābu ọdudù mba nile, na ọzara, na ala kpọrọ nku, na ala ihe nādighi. 13 Site n'iwe Jehova madu agaghi-ebi nime ya, ma ọ gābusi ebe tọb͕ọrọ n'efu; ọ gēju onye ọ bula nke nāgabiga n'akuku Babilon anya, ọ gāma ọsọ n'ihi ihe-otiti-ya nile. 14 Donu onwe-unu n'usoro imegide Babilon buruburu, unu ndi nile ndi nāzọ uta ukwu ikwe ya; b͕anu ya, unu asọlara àkú anya: n'ihi na Jehova ka o mehieworo megide. 15 Kpọnu nkpu-agha megide ya buruburu; o kweyewo ekweye; ihe-nkwagide-ya nile adawo, etikpọwo kwa mb͕idi-ya nile: n'ihi na ibọ̀-ọ́bọ̀ Jehova ka ọ bu: bọ̀nu ya ọ́bọ̀; dika ọ meworo, menu ya otú a. 16 Bipunu ọgha-nkpuru nime Babilon, ya na onye nēji mma-iwe-ihe-ubi na mb͕e owuwe-ihe-ubi: n'iru mma-agha nēme ihe-ike ha gēche iru, onye ọ bula n'ebe ndi-ya nọ, ha gāb͕alaga kwa, onye ọ bula n'ala-ya. 17 Aturu nke emeworo ka ọ wagharia ka Israel bu; ọdum di iche iche achupuwo ya: ọdum nke-mbu, bú eze Asiria, ripiara ya; ma ọdum ikpe-azu a, bú Nebukadreza eze Babilon, ab͕ajiwo ọkpukpu-ya nile. 18 N'ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, ji si otú a: Le, M'gaje iji nmehie-ya leta eze Babilon, leta kwa ala-ya, dika M'jiworo nmehie eze Asiria leta ya. 19 M'gēme kwa ka Israel lata n'ebe-ita-nri-ya, ọ gāta kwa nri na Kamel na Beshan, ọ bu kwa n'ugwu Efraim na nime Gilead ka afọ gēju nkpuru-obi-ya. 20 N'ubọchi ahu, na na mb͕e ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), agāchọ ajọ omume Israel, ma ọ gaghi-adi; agāchọ kwa nmehie nile nke Juda, ma agaghi-achọta kwa ha: n'ihi na M'gāb͕aghara ndi M'nēme ka ha fọdu nmehie-ha. 21 Rigo megide ala Merataim, imegide ya, rigo kwa rue ndi bi na Pekod: b͕ue, wezuga kwa ka ebibie n'azu ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), me kwa dika ihe nile si di nke M'nyeworo gi n'iwu. 22 Olu agha di n'ala nka, na olu ntipia uku. 23 Le ka esiworo bipu otùtù nke uwa nile, b͕aji kwa ya nke-uku! le ka Babilon siworo ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu nke-uku n'etiti mba nile! 24 Esiworom i ọnyà, ọzọ kwa, amawo gi n'ọnyà ahu, gi Babilon, ma gi onwe-gi amagh: achọtawo gi, ọzọ kwa, ejidewo gi, n'ihi na Jehova ka i lusoworo ọ̀gù. 25 Jehova emeghewo ulo-àkù-Ya, chiputa ihe-agha nile nke oké iwe-Ya: n'ihi na ozi di nke Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nēje n'ala ndi Kaldea. 26 Sinu na nsọtu-ya biarue ya, meghenu ọba-ya nile: tulienu ya dika obo-ihe, wezuga-kwa-nu ya ka ebibie ya: ekwela ka ihe fọduru ya. 27 Gbuenu oke-ehi-ya nile; ka ha rida ka ewe b͕ue ha: ahuhu diri ha! n'ihi na ubọchi-ha abiawo, bú mb͕e nleta-ha. 28 Ge nti olu ndi nāb͕alaga, ndi nāb͕apu n'ala Babilon, igosi ibọ̀-ọ́bọ̀ nke Jehova, bú Chineke-ayi, na Zaion, bú ibọ̀-ọ́bọ̀ nke ulo uku Ya. 29 Menu ka ndi-ọb͕a-uta nuru izukọ imegide Babilon, bú ndi nile nāzọ uta ukwu ikwe ya; manu ulo-ikwū-unu imegide ya buruburu; ya ghara inwe ndi b͕apuru ab͕apu: kwughachinu ya ugwọ dika ọlu-ya si di; dika ihe nile si di nke o meworo, menu ya otú a: n'ihi na Jehova ka o meworo nganga megide, megide Onye Nsọ nke Israel. 30 N'ihi nka ka umu-okorọbia-ya gāda n'amá-ya nile, agēme kwa ka ndi-agha-ya nile dere du n'ubọchi ahu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 31 Le, Mu nēmegide gi, gi onye-nganga, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, puta): n'ihi na ubọchi-gi abiawo, bú mb͕e M'gēleta gi. 32 Onye-nganga gāsu kwa ngọngọ, da, ma ọ dighi onye ganēme ka o bilie: M'gēsuye kwa ọku n'obodo ya nile, o gēripia kwa ebe nile di ya buruburu. 33 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ndi emeb͕uru emeb͕u ka umu Israel na umu Juda bu n'otù: ndi nile dọtaworo ha n'agha ejidesiwo ha ike; ha ajuwo izilaga ha. 34 Onye-nb͕aputa-ha di ike; Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya: Ọ gēkpezu ọnu-ha, ka O we me ka uwa doro aru ala, me kwa ka ndi bi na Babilon me nkpatu. 35 Mma-agha di n'aru ndi Kaldea, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na n'ebe ndi bi na Babilon nọ, na n'ebe ndi-isi-ya nọ, na n'ebe ndi-ya mara ihe nọ. 36 Mma-agha di n'ebe ndi-ekwukwu nọ, ha gāghọ ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha: mma-agha di n'ebe ndi-dike-ya nọ, ha gātu kwa ujọ. 37 Mma-agha di n'ebe inyinya-ya nile di, na n'ebe ub͕ọ-ala-ya di, na n'ebe ndi nile gwara ọgwa nọ, bú ndi nọ n'etiti ya, ha gāghọ kwa ndinyom: mma-agha di n'ebe àkù-ya nile di, agāluta kwa ha n'agha. 38 Ọkpukpọ-nku di n'ebe miri-ya nile di, ha gāta kwa ata: n'ihi na ala arusi di iche iche apiri api ka ọ bu, ha ji kwa ihe-egwu nile ha wi ara. 39 N'ihi nka ka anu-ọhia di iche iche nke bi n'ala kpọrọ nku gēbi n'ebe ahu, ha na anu-ọhia nke nēbe ebe, enyi-nnunu gēbi kwa n'ebe ahu: madu agaghi-ebi kwa nime ya ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi; ọ gaghi-abu kwa ebe-obibi rue ọb͕ọ nile. 40 Dika mb͕e Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra na ab͕ata nile ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); otú a ọ dighi onye ọ bula gēbi n'ebe ahu, nwa madu ọ bula agaghi-anọ kwa dika ọbìa nime ya. 41 Le, otù ndi nēsi n'Ugwu bia; ọzọ, mba uku na ọtutu ndi-eze ka agākpọte site na nsọtu nile nke uwa. 42 Uta na ube ka ha nējide; mba di irè ka ha bu, ha adighi-enwe obi-ebere; olu-ha nēbib͕ọ dika oké osimiri, ọ bu kwa inyinya ka ha nānọkwasi; edoro mba ahu n'usoro, dika onye nēbu agha, imegide gi, ada Babilon. 43 Eze Babilon anuwo ùdé-ha, aka-ya abua we kuda: ihe-nb͕u ejidewo ya, ihe-nb͕ali dika nke nwanyi ime nēme. 44 Le, dika ọdum ka ọ nārigo, bú nke si na nbili-elu nke Jọdan arigo, rue ebe-ita-nri nādigide mb͕e nile: ma n'otù ntabi-anya ka M'gēme ka ha si n'aru ya b͕a ọsọ; ma ònye bu onye arọputara? onye-nlekọta-ya ka M'gēme ya: n'ihi na ònye di kam? ọ̀ bu kwa onye gākaram mb͕e? ma-ọbu ònye bu kwa onye-ọzùzù-aturu a nke gēguzo n'irum? 45 N'ihi nka nurunu ndum-ọdu Jehova, nke Ọ duworo megide Babilon; na èchìchè-Ya nile nke O chèworo megide ala ndi Kaldea, si: N'ezie ha gādọkpupu ha, bú ndi ntà nke ìgwè ewu na aturu: n'ezie ọ gēju ebe-ita-nri-ha anya bayere ha. 46 Site n'olu nke owuwe Babilon uwa mara jijiji, anuwo kwa iti-nkpu n'etiti mba nile.

Jeremaia 51

1 Otú a ka Jehova siri: Le, M'gaje ikpọte ifufe nke nēbibi ebibi megide Babilon, na n'ebe ndi bi na Leb-kamai nọ. 2 M'gēziga-kwa-ra Babilon ndi ala ọzọ, ndi gāfucha ya; ha gāwusi kwa ala-ya dika miri; n'ihi na ha nọ nēmegide ya buruburu n'ubọchi ihe ọjọ. 3 Ka okwe-uta kwe uta-ya n'ebe onye nēkwe uta nọ, na n'ebe onye nēweli onwe-ya elu n'uwe-agha-ya nọ: unu enwe-kwa-la ọmiko n'aru umu-okorọbia-ya; wezuganu usu-ndi-agha-ya nile ka ebibie ya. 4 Ha gāda kwa, buru ndi eb͕uru eb͕u, n'ala ndi Kaldea, na ndi adupuru adupú, n'èzí-ya nile. 5 N'ihi na Israel, ma-ọbu Juda, abughi nwanyi nke di-ya, bú Chineke-ya, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nwuru anwu; ọ bu ezie na ala-ha juputara n'ikpe-ọmuma megide Onye Nsọ nke Israel. 6 Sinu n'etiti Babilon b͕alaga, wepuga-kwa-nu onwe-unu n'otù n'otù; unu ekwela ka eme unu ka unu dere du n'ajọ omume-ya: n'ihi na mb͕e ibọ̀-ọ́bọ̀ ka ọ buru Jehova; nmeso obodo ahu ka Ya onwe-ya nākwughachi ya. 7 Iko ọla-edo ka Babilon buworo n'aka Jehova, nke nēme ka uwa nile ṅubiga manya ókè: ufọdu nime manya-vine-ya ka mba di iche iche ṅuworo; n'ihi nka ka mba di iche iche nāwi ara. 8 Na mberede ka Babilon daworo, ewe tipia ya: kwasierenu ya ákwá ike; werenu balm bayere ihe-nb͕u-ya ma eleghi anya agāgwọta ya. 9 Ayi gāgwọtawori Babilon, ma agwọtaghi ya: rapunu ya, ka ayi la, onye ọ bula n'ala-ya: n'ihi na ikpé-ya erutuwo elu-igwe, ebuliwo kwa ya rue mbara-ígwé. 10 Jehova emewo ka ezi omume nile ayi puta: bianu, ka ayi kọ akukọ ọlu Jehova, bú Chineke-ayi, nime Zaion. 11 Muchanu àkú nile; jidesienu ọta nile ike: Jehova akpọtewo mọ nke ndi-eze Midia; n'ihi na imegide Babilon ka nzube-Ya di, ibibi ya: n'ihi na ibọ̀-ọ́bọ̀ Jehova ka ọ bu, bú ibọ̀-ọ́bọ̀ nke ulo uku Ya. 12 Bulienu ọkọlọtọ n'ebe mb͕idi nile nke Babilon di, menu ka nche sie ike, menu ka ndi-nche guzosie ike, dozienu uju nēru nbì; n'ihi na Jehova ezubewo me kwa ihe O kwuru megide ndi bi na Babilon. 13 Gi onye bi n'elu ọtutu miri, onye nwere ọtutu àkù, ọgwugwu-gi abiawo, bú ọtùtù nke urù-gi nēzighi ezi. 14 Jehova nke usu nile nke ndi-agha ejiwo Onwe-ya ṅu iyi, si, N'ezie M'gēmeju gi na madu, dika igurube; ha gēti kwa nkpu megide gi, bú nkpu nke nzọcha-nkpuru-vine. 15 Onye jiworo ike-Ya me uwa, Onye jiworo amam-ihe-Ya me ka elu-uwa dum madu bi guzosie ike, Onye jiworo nghọta-Ya setipu elu-igwe: 16 mb͕e Ọ nēme ka olu-Ya da, ùzù miri di n'elu-igwe, O we me ka alulu si na nsọtu uwa kwugo; O meworo miri-ozuzo àmùmà, Ọ nēme kwa ka ifufe si n'olu-nkwakọba-Ya nile puta. 17 Nání anu-ọhia ka madu ọ bula ghọworo site n'ihe-ọmuma-ya; emewo ka ihere me onye-nnucha-ọla ọ bula site n'arusi-ya apiri api: n'ihi na ugha ka arusi-ya awuru awu bu, nku-ume adighi kwa nime ha. 18 Ihe-efu ka ha bu, ọlu ikwa-emò: na mb͕e nleta-ha ha gāla n'iyì. 19 Ọ bughi dika ihe ndia ka òkè Jekob bu; n'ihi na onye nākpu ihe nile ka Ọ bu; Israel bu kwa ebo nke ihe-nketa-Ya: Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya. 20 Anyu-ike-agha ka i burum na ihe-agham nile; ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia mba di iche iche; ọ bu kwa gi ka M'gēji bibie ala-eze di iche iche; 21 ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia inyinya na onye nānọkwasi ya; ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia ub͕ọ-ala na onye nānọkwasi ya; 22 ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia nwoke na nwanyi; ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia agadi-nwoke na nwa-okoro; ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia nwa-okorọbia na nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke; 23 ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia onye-ọzùzù-aturu na ìgwè aturu-ya; ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia onye-ọlu-ubi na ehi-ya ejikọrọ abua abua; ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia ndi nāchi ala na ndi nọchiri anya eze. 24 M'gākwughachi kwa Babilon, kwughachi kwa ndi nile bi na Kaldea, ihe ọjọ nile ha nke ha meworo nime Zaion n'anya-unu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 25 Le, Mu nēmegide gi, gi ugwu nēbibi ebibi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), nke nēbibi uwa nile: M'gēseti kwa akam imegide gi, kpọreda gi site na nkume-gi nile di elu, mee ka i ghọ ugwu esurere esure. 26 Ha agaghi-eweputa nime gi otù nkume ido na nkuku-ulo, ma-ọbu otù nkume itọ ntọ-ala; n'ihi na ebe nke tọb͕ọrọ n'efu mb͕e ebighi-ebi ka i gābu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 27 Bulienu ọkọlọtọ n'ala ahu, fùanu opì-ike n'etiti mba nile, donu mba di iche iche nsọ imegide ya, menu ka ala-eze, bú Ararat, na Mini, na Ashkenaz, nuru, zukọ imegide ya: menu ka otù ọchi-agha buru onye-nlekọta imegide ya; menu ka inyinya rigota dika igurube di egwu. 28 Donu mba di iche iche nsọ imegide ya, donu ndi-eze Midia, na ndi nāchi ala-ya, na ndi-ya nile nọchiri anya eze, na ala nile ọ nāchi, nsọ. 29 Ala ahu we nāma jijiji, nāb͕ali kwa: n'ihi na èchìchè nile nke Jehova megide Babilon eguzosiwo ike, ime ka ala Babilon ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ghara inwe onye-obibi. 30 Ndi-dike Babilon arapuwo ibu agha, ha nọduru n'ebe nile ha ewusiri ike; idi-ike-ha alasiwo; ha aghọwo ndinyom: ndi-iro-ha esuyewo ọku n'ebe-obibi-ya nile; etijiwo ihe-ntuchi-ya nile. 31 Otù ọb͕a-ọsọ gāb͕a ọsọ izute ọb͕a-ọsọ-ibe-ya, otù onye-ngosi gāb͕a kwa ọsọ izute onye-ngosi-ibe-ya, igosi eze Babilon na ewerewo obodo-ya na nsọtu-ya: 32 ọ bu kwa ngabiga-miri nile ka ewereworo, ọ bu kwa ọdọ-miri nile ka ha sureworo ọku, ndi-agha amawo kwa jijiji. 33 N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Ada Babilon di ka ebe-nzọcha-ọka mb͕e anāzọcha ya; nwa mb͕e fọduru, mb͕e owuwe-ihe-ubi ewe biarue ya aru. 34 Nebukadreza, bú eze Babilon, eripiawom, o kpochapuwom, o mewom ka m'ghọ aria nke ihe nādighi, o lowom dika ogologo anu-miri, o mejuwo afọ-ya n'ihe-utọm nile, ọ chupuwom. 35 Ihe-ikem na nke anu-arum di n'isi Babilon, ka nwanyi nke bi na Zaion gāsi; ọzọ, Ọbaram di n'isi ndi bi na Kaldea, ka Jerusalem gāsi. 36 N'ihi nka ka Jehova ji si otú a: Le, M'gaje ikpe ọnu-gi, bọ̀ ọ́bọ̀-gi; M'gēme kwa ka oké osimiri-ya tasia, me kwa ka isi-iyi-ya takọrọ. 37 Babilon gāghọ kwa nání obo-ihe obo-ihe, ebe-obibi nkita-ọhia, na ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ, ghara inwe onye-obibi. 38 N'otù ka ha gāb͕ọ uja dika umu-ọdum; ha edekpọwo dika umu-ọdum nāṅu ara. 39 N'okpom-ọku-ha ka M'gēme ọṅuṅu-manya nile ha, mee ka ha ṅubiga manya ókè, ka ha we ṅuria ọṅu-agha, raru ura ebighi-ebi, ghara iteta; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 40 M'gēme ka ha rida dika umu-aturu ka ewe b͕ue ha, dika ebulu, ha na nkpi. 41 Le, ka esiworo were Shishak! le, ka esiworo jide otuto uwa nile! le, ka Babilon siworo ghọ ihe-iju-anya n'etiti mba nile! 42 Oké osimiri erukpuwo Babilon: ejiwo nkpọtu nmali-miri-ya nile kpuchie ya. 43 Obodo-ya nile aghọwo ihe-iju-anya, na ala kpọrọ nku, na ala ihe nādighi, bú ala nke ọ nādighi onye ọ bula nēbi nime ha, nwa madu ọ bula adighi-agabiga kwa nime ha. 44 M'gēji kwa nmehie-ya leta Bel nime Babilon, M'gēme kwa ka ihe o loworo si n'ọnu-ya puta; mba di iche iche agaghi-erùkuru kwa ya ọzọ dika miri: ọzọ mb͕idi Babilon gāda. 45 Sinu n'etiti ya pua, unu ndim, wepuganu onwe-unu n'otù n'otù n'iwe di ọku nke Jehova. 46 Lezi-kwa-nu anya ka obi-unu ghara ilọ unu miri, ka unu ghara itu egwu n'ihi akukọ ahu nke anānu n'ala ahu; n'ihi na akukọ ahu gābia n'otù arọ, emesia n'arọ ọzọ akukọ ahu gābia kwa, ihe-ike gādi kwa n'ala ahu, onye nāchi achi nēmegide onye nāchi achi. 47 N'ihi nka, le, ubọchi nābia, mb͕e M'gēji nmehie-ha leta arusi nile apiri apiri nke Babilon, ihere gēme kwa ala-ya nile; ndi-ya nile eb͕uru eb͕u gāda kwa n'etiti ya. 48 Elu-igwe na uwa na ihe nile nke di nime ha ewe tie nkpu ọṅù bayere Babilon; n'ihi na ndi nāpunara ya ihe gēsi n'Ugwu biarue ya aru; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 49 Ọbuná Babilon aghaghi ida, unu ndi eb͕uru eb͕u nke Israel, ọ bu kwa na Babilon ka ndi ala ahu nile eb͕uru eb͕u gāda. 50 Unu ndi b͕apuworo na mma-agha, jenu, unu eguzola; chetanu Jehova site n'ebe di anya, ka Jerusalem bata kwa n'obi-unu. 51 Ihere emewo ayi, n'ihi na ayi anuwo ita-uta; ọnọdu-ihere etiyere ayi nime ya ekpuchiwo ayi n'iru: n'ihi na ndi ala ọzọ abàwo imegide ebe nsọ nile nke ulo Jehova. 52 N'ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gēji nmehie-ha leta arusi-ya nile apiri api; ọ bu kwa n'ala-ya nile ka ndi emeruworo aru gāsu udè. 53 Asi na Babilon arigorue elu-igwe, asi kwa na o wusie ebe di elu nke ike-ya ike, ma na Mu ka ndi nāpunara ya ihe gēsi biarue ya aru; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 54 Ge nti olu iti-nkpu sitere na Babilon, na olu ntipia uku sitere n'ala ndi Kaldea! 55 n'ihi na Jehova nāpunara Babilon ihe-ya, Ọ nēme kwa ka oké olu si nime ya la n'iyì; nmali-miri nile ha we bib͕ọ dika ọtutu miri, nkpọtu nke olu-ha akpọtuwo: 56 n'ihi na onye nāpunara ya ihe-ya ab͕iakwasiwo obodo ahu, bú Babilon, ejidewo kwa ndi-dike-ya, ab͕ajisiwo uta nile ha: n'ihi na Chineke nke nēmeso madu otú ha si eme ka Jehova bu, Ọ ghaghi ikwughachi. 57 M'gēme kwa ndi-isi-ya, na ndi-ya mara ihe, na ndi-ya nāchi ala, na ndi-ya nọchiri anya eze, na ndi-dike-ya, ka ha ṅubiga manya ókè; ha gāraru kwa ura ebighi-ebi, ghara iteta; ọ bu ihe si n'ọnu Eze ahu puta, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya. 58 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Mb͕idi nile nke Babilon nke sara mbara, agēme ka ha ghọ ebe dasiri adasi, ọzọ, ọnu-uzọ-ama-ya nile nke di elu, agēji ọku sure ha; ndi nile di iche iche gādọb͕u kwa onwe-ha n'ọlu n'efu, mba di iche iche gādọb͕u onwe-ha n'ọlu itiye n'ọku: ike ewe gwu ha. 59 Okwu ahu nke Jeremaia, bú onye-amuma, nyere Seraia nwa Neraia, nwa Mahseia, n'iwu, mb͕e o soro Zedekaia, bú eze Juda, je Babilon n'arọ nke-anọ nke ọbubu-eze-ya. Ma Seraia bu onye-isi idozi ebe-izu-ike nke eze. 60 Jeremaia we de ihe ọjọ ahu nile nke gābiaru Babilon aru n'otù akwukwọ, bú okwu ndia nile nke edeworo bayere Babilon. 61 Jeremaia we si Seraia, Mb͕e i bàra na Babilon, gi le anya ka i gua okwu ndia nile, 62 si, Jehova, Gi onwe-gi ekwuwo okwu bayere ebe a ibipu ya, ka ihe ọ bula we ghara ibi nime ya, ma ọ bu madu ma-ọbu anumanu, n'ihi na ebe tọb͕ọrọ n'efu mb͕e ebighi-ebi ka ọ gābu. 63 Ọ gēru kwa, mb͕e i gubisiri akwukwọ a, na i gēkegide ya nkume, tubà ya n'etiti Yufretis: 64 i gāsi kwa, Otú a ka Babilon gēmikpu, ghara ibili ọzọ n'ihi ihe ọjọ ahu nke Mu onwem gaje ime ka ọ biakwasi ya: ike ewe gwu ha. Rue ebe a bu okwu Jeremaia.

Jeremaia 52

1 Zedekaia b͕ara orú arọ na otù mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ iri na otù nime Jerusalem: aha nne-ya bu Hamutal nwa Jeremaia nke Libna. 2 O mee ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika ihe nile si di nke Jehoiakim mere. 3 N'ihi na ọ bu n'ihi iwe Jehova ka ọ di otú a nime Jerusalem na Juda, rue mb͕e O siri n'iru Ya chupu ha: Zedekaia we nupu isi n'okpuru eze Babilon. 4 O rue, n'arọ nke-iteghete nke ọ bu eze, n'ọnwa nke-iri, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu, na Nebukadreza, bú eze Babilon, biara, ya onwe-ya na usu-ndi-agha-ya nile, imegide Jerusalem, ha we ma ulo-ikwū-ha megide ya; ha we wue ulo-agha imegide ya buruburu. 5 Ewe nānọchigide obodo ahu n'agha rue arọ nke-iri-na-otù nke eze, bú Zedekaia. 6 N'ọnwa nke-anọ, n'ubọchi nke-iteghete nke ọnwa ahu, oké unwu siri ike n'obodo ahu, ọ dighi kwa nri ndi ala ahu nwere. 7 Ewe tipue obodo, ndi-agha nile we b͕apu, pua n'obodo n'abali n'uzọ ọnu-uzọ-ama n'etiti mb͕idi-ya abua, nke di n'akuku ubi eze ab͕ara ogige; (ma ndi Kaldea nānọ imegide obodo buruburu: ) ha we je n'uzọ Araba. 8 Usu-ndi-agha ndi Kaldea we chua eze n'azu, rue Zedekaia aru n'ala ihe nādighi nke Jeriko; ma usu-ndi-agha-ya nile siri n'ebe ọ nọ b͕asasia. 9 Ha we jide eze, me ka ọ rigokuru eze Babilon rue Ribla n'ala Hemat; o we kwue okwu ikpé n'ebe ọ nọ. 10 Eze Babilon we b͕ue umu-ndikom Zedekaia n'anya-ya, ọ bu kwa ndi-isi nile nke Juda ka o b͕uru na Ribla. 11 O me-kwa-ra ka Zedekaia kpue ìsì n'anya-ya abua; eze Babilon we were ihe-ọla eji ke ukwu ke ya ab͕u, me ka ọ ba na Babilon, tiye ya n'ulo-ndebe rue ubọchi ọnwu-ya. 12 Ma n'ọnwa nke-ise, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu, nke ahu bu arọ nke-iri-na-iteghete nke eze, bú Nebukadreza, eze Babilon, ka Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, onye guzoro n'iru eze Babilon, batara na Jerusalem: 13 o sure ulo Jehova ọku, na ulo eze; ọ bu kwa ulo nile nke Jerusalem, bú ulo uku ọ bula, ka o surere n'ọku. 14 Usu-ndi-agha nile nke ndi Kaldea, ndi soro onye-isi ndi-ob͕ū, kwatu-kwa-ra mb͕idi nile nke Jerusalem buruburu. 15 Ma ufọdu nime ndi Israel nēnweghi ike, na ndi Israel fọduru, bú ndi fọduru n'obodo, na ndi gbapuru agbapu, bú ndi gbapuru jekuru eze Babilon, na ndi fọduru n'etiti ìgwè madu, ndia ka Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ha je biri n'ala ọzọ. 16 Ma ufọdu nime ndi ala ahu ndi nēnweghi ike ka Nebuzaradan, onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ha fọdu ibu ndi-ọlu-ubi-vine na ibu ndi-ọlu-ubi. 17 Ma ogidi ọla nile nke di n'ulo Jehova, na ihe-ndọkwasi nile na oké osimiri ọla nke di n'ulo Jehova, ndia ka ndi Kaldea tipiara, chiri ọla-ha nile je Babilon. 18 Ite nile kwa, na osekè nile, na ihe-ikpakepu-ọku nile, na ọkwa-nwusa nile, na ngaji nile, na ihe ọla nile nke ha ji eje ozi, ndia ka ha chipuru. 19 Ọkwa nile kwa, na ihe-igu-ọku nile, na ọkwa-nwusa nile, na ite nile, na ihe-idọba-oriọna nile, na ngaji nile, na iko nile; ihe nke bu ọla-edo, n'ọla-edo, na ihe nke bu ọla-ọcha, n'ọla-ọcha, onye-isi ndi-ob͕ū chipuru ha. 20 Ogidi abua ahu, na otù oké osimiri ahu, na ehi iri na abua nke ọla nke di n'okpuru ihe-ndọkwasi-ya nile, nke eze, bú Solomon, mere nye ulo Jehova; ọ dighi ọtùtù atùru ọla ihe ndia nile. 21 Ma ogidi abua ahu, cubit iri na asatọ ka idi-elu otù ogidi di; ogho cubit iri na abua b͕a-kwa-ra ya buruburu; ib͕idi-ya di nkpisi-aka anọ: ọ di oghere n'ime-ya. 22 Isi nke di n'elu ya bu kwa ọla; idi-elu otù isi ahu di cubit ise; ihe-ọkpukpa na pomegranate di kwa n'isi ahu buruburu, ha nile bu ọla: ihe dika ndia ka ogidi nke-abua nwe-kwa-ra, ha na pomegranate. 23 Ma pomegranate ahu di ọgu anọ na iri na isi n'akuku ọ bula; pomegranate nile di ọgu ise n'elu ihe-ọkpukpa buruburu. 24 Onye-isi ndi-ob͕ū we chiri Seraia, bú onye-isi-nchu-àjà, na Zefanaia, bú onye-nchu-àjà nke-abua, na ndi-nche atọ nke nbata-uzọ: 25 o si-kwa-ra n'obodo chiri otù onozi nke emeworo onye-nlekọta ndikom agha; na ndikom asa nime ndi nāhu iru eze, ndi achọtara n'obodo; na ode-akwukwọ, bú onye-isi usu-ndi-agha, onye nēme ka ndi ala ahu zukọta ibu agha; na ọgu ndikom atọ nime ndi ala ahu, ndi achọtaworo n'etiti obodo. 26 Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, we chiri ha, me ka ha jekuru eze Babilon, rue Ribla. 27 Eze Babilon we tib͕ue ha, me ka ha nwua na Ribla, n'ala Hemat. Ewe me ka Juda si n'ala-ya je biri n'ala ọzọ. 28 Nka bu ndi ahu nke Nebukadreza mere ka ha je biri n'ala ọzọ; n'arọ nke-asa nnù ndi-Ju asa na ọgu iri-na-otù na atọ: 29 n'arọ nke-iri-na-asatọ nke Nebukadreza ka o mere ka nnù madu abua na orú na iri na abua si na Jerusalem je biri n'ala ọzọ: 30 n'arọ nke-orú-na-atọ nke Nebukadreza ka Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ndi-Ju ufọdu, bú nnù madu na ọgu iri-na-asa na ise, je biri n'ala ọzọ: madu nile di nnù iri na otù na ọgu iri. 31 O rue, n'arọ nke-orú-na-iri-na-asa nke emere ka Jehoiakin, bú eze Juda, je biri n'ala ọzọ, n'ọnwa nke-iri-na-abua, n'ubọchi nke-orú-na-ise nke ọnwa ahu, na Evil-merodak, bú eze Babilon, n'arọ ọ malitere ibu eze, o weliri isi Jehoiakin, bú eze Juda, me ka o si n'ulo-nkpọrọ puta; 32 o we gwa ya okwu ọma, do oche-eze-ya elu kari oche-eze nke ndi-eze ndi ya na ha nọ na Babilon. 33 O we b͕anwe uwe nkpọrọ ya, o we nēri nri n'iru ya mb͕e nile ubọchi nile nke ndu-ya. 34 Anēnye kwa ya òkè-ihe-oriri-ya, bú òkè-ihe-oriri mb͕e nile, site n'aka eze Babilon, ihe nke ubọchi n'ubọchi-ya rue ubọchi ọnwu-ya, ubọchi nile nke ndu-ya.

Abù-Ákwá 1

1 Le, ka obodo ahu nke ndi-ya di ọtutu si nọdu ala nání ya! Le, ka o siworo ghọ ihe di ka nwanyi di-ya nwuru! Obodo nke riri nne n'etiti mba nile, nke bu isi n'etiti ala nile anāchi achi, Le, ka o siworo ghọ usu ndi nēfè òfùfè. 2 Ọ nākwasi ákwá ike n'abali, anya-miri-ya di kwa na ǹtì-ya abua; Ọ dighi onye-nkasi-obi o nwere n'etiti ndi nile nāhu ya n'anya: Ndi-eyì-ya nile aghọb͕uwo ya, Ha aghọworo ya ndi-iro. 3 Juda ejewo ibiri n'ala ọzọ site na nweda-n'ala, na site n'iba-uba nke ọbubu-orù; Ya onwe-ya ebiriwo n'etiti mba nile, ọ chọtaghi izu-ike: Ndi nile ndi nāchu ya chukuru ya n'ebe di nkpà. 4 Uzọ nile nke Zaion nēru újú, n'ihi na ọ dighi ndi nābia na mb͕e akara àkà; Ọnu-uzọ-ama-ya nile tọb͕ọrọ n'efu; ndi-nchu-àjà-ya nēze ume: 5 Ndi nākpab͕u ya aghọwo ndi-isi, ndi-iro-ya nọ n'udo; N'ihi na Jehova emekpawo ya aru n'ihi iba-uba nke njehie-ya nile: Umu-ntakiri-ya alawo dika ndi adọtara n'agha n'iru onye-nkpab͕u. 6 Ima-nma-ya nile esiwo kwa n'aru ada Zaion pua: Ndi-isi-ya aghọwo ele nke nāchọtaghi ebe-ita-nri, Ha we je ije nēnweghi ike n'iru onye nāchu ha. 7 Jerusalem echetawo n'ubọchi nile nke nweda-n'ala-ya na nke nwaghari-ya nileIhe nile ya anāchọsi ike nke diri site n'ubọchi nile nke mb͕e ochie: Mb͕e ndi-ya dabàra n'aka onye-nkpab͕u, ma ọ dighi onye nēyere ya aka, Ndi-nkpab͕u huru ya, ha chìri nkwusi-ya nile ọchì. 8 Jerusalem emehiewo nke-uku; n'ihi nka ka ọ ghọworo ihe ruru árú: Ndi nile ndi nāsọpuru ya-ri elelìwo ya anya, n'ihi na ha ahuwo ọtọ-ya: E, ya onwe-ya ezewo ume, we chigharia azu. 9 Ọrurú-ya di n'ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-ya; o chetaghi ikpe-azu-ya; O we rida n'uzọ di ebube; ọ dighi onye-nkasi-obi o nwere: Jehova, le nweda-n'alam; n'ihi na onye-iro emewo onwe-ya ka ọ di uku. 10 Onye-nkpab͕u ab͕asawo aka-ya n'elu ihe-utọ nile nke Jerusalem: N'ihi na ọ huwo na mba di iche iche abatawo n'ebe nsọ ya, Bú ndi I nyere iwu bayere ha na ha agaghi-abà nime nkpọkọta I nwere. 11 Ndi-ya nile nēze ume, ha nāchọ nri; Ha enyewo ihe nile ha anāchọsi ike n'ọnọdu ihe-oriri iweghachi nkpuru-obi: Le, Jehova, legide anya; n'ihi na aghọwom ihe jọb͕uru onwe-ya. 12 Ọ̀ bughi unu ihe, unu nile ndi nāgabiga n'uzọ? Legidenu, hu ma ọ di ihe-nb͕u dika ihe-nb͕um di, bú nke anēme mu, Onye Jehova mekpaworo aru n'ubọchi iwe-Ya di ọku. 13 N'elu ka O siri zite ọku n'ọkpukpum nile, o we nwe ike n'aru ha: Ọ b͕asaworo ukwum abua ub͕u, O mewo ka m'laghachi azu; O mewom ka m'ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu na onye aru nādighi ike ogologo ubọchi nile. 14 Aka-Ya ekewo yoke nke njehiem nile; Akpakọwo ha n'otù, ha arigotawo n'olum; O mewo ka ikem su ngọngọ: Onye-nwe-ayi enyewom n'aka-ha, bú ndi m'nāpughi iguzosi ike megide. 15 Onye-nwe-ayi eledawo ndim nile di ebube anya n'etitim: Ọ kpọsawo mb͕e akara àkà imegidem itipia umu-okorọbiam: Ebe-nzọcha-nkpuru-vine ka Onye-nwe-ayi zọchaworo nye ada Juda nāmaghi nwoke. 16 N'ihi ihe ndia ka mu onwem nākwa ákwá; anyam, anyam nērùda miri; N'ihi na onye-nkasi-obi nke nēweghachi nkpuru-obim di anya n'ebe m'nọ; Umum tọb͕ọrọ n'efu, n'ihi na onye-iro di ike. 17 Zaion ab͕asawo aka-ya abua; ọ dighi onye-nkasi-obi o nwere; Jehova enyewo iwu bayere Jekob, na ndi nọ ya buruburu gābu ndi nākpab͕u ya: Jerusalem aghọwo ihe-isọ-nsọ n'etiti ha. 18 Onye ezi omume ka Jehova bu; n'ihi na okwu-ọnu-Ya ka m'nupuworo isi megide: Biko, nurunu, unu ndi nile di iche iche, le-kwa-nu ihe-nb͕um: Umu-ab͕ọghọm nāmaghi nwoke na umu-okorọbiam alawo n'etiti ndi adọtara n'agha. 19 Akpọkurum ndi nāhum n'anya, ma ha onwe-ha ghọb͕urum: Ndi-nchu-àjàm na ndi-okenyem kubìri ume n'obodom, Mb͕e ha nāchọrọ onwe-ha ihe-oriri ka ha we weghachi nkpuru-obi-ha. 20 Le, Jehova; n'ihi na ahuhu dirim; ngiri-afọm nānum ọku; Obim nātughari nimem; n'ihi na enupuwom isi nke-uku: N'èzí mma-agha ab͕abawom aka nwa, n'ulo ihe dika ọnwu di. 21 Ha anuwo na onye nēze ume ka m'bu; ọ dighi onye-nkasi-obi m'nwere; Ndi-irom nile anuwo ihe ọjọm; obi atọwo ha utọ na Gi onwe-gi emewo ya: I gēme ka ọ bia, bú ubọchi I kpọsaworo, ha ewe di ka mu onwem. 22 Ka ihe ọjọ nile ha bia n'iru Gi; Gi me kwa ha, dika I meworom n'ihi njehiem nile: N'ihi na ize-umem di ọtutu, aru adighi kwa obim ike.

Abù-Ákwá 2

1 Le, ka Onye-nwe-ayi si were igwe-oji kpuchie ada Zaion n'iwe-Ya! O siwo n'elu-igwe tuda ima-nma nke Israel n'ala, Ọ chetaghi kwa ihe-nb͕akwasi-ukwu-Ya n'ubọchi iwe-Ya. 2 Onye-nwe-ayi elowo ebe-obibi nile nke Jekob, ghara inwe ọmiko n'aru ha; Ọ kwadawo ebe nile ewusiri ike nke ada Juda nime nrubiga-ókè nke iwe-Ya: O tidaruwo ha ala: O mewo ala-eze na ndi-isi-ya ka ha ghara idi nsọ. 3 O bipuwo mpi nile ọ bula nke Israel n'iwe di ọku; O seghachiwo aka-nri-Ya azu site n'iru onye-iro: O rechapuwo kwa Jekob dika ọku nēnwu enwu, nke nēripia buruburu. 4 Ọ zọwo uta-Ya ukwu ikwe ya dika onye-iro, O werewo aka-iri-Ya guzo Onwe-ya dika onye-nkpab͕u, We b͕ue ndi nile anya nāchosi ike: N'ulo-ikwū nke ada Zaion ka Ọ wusiworo ọnuma-Ya dika ọku. 5 Onye-nwe-ayi adiwo ka onye-iro, Ọ lodawo Israel; O lodawo ulo-elu-ya nile, O bibiwo ebe-Ya nile ewusiri ike: O me ka ize-ume na isu-ude ba uba n'ada Juda. 6 Ọ napuwo kwa ulo-ntu-Ya n'ike, dika agāsi na ọ bu nke ubi ab͕ara ogige; O bibiwo mb͕e-Ya akara àkà: Jehova emewo ka echezọ mb͕e akara àkà na ubọchi-izu-ike nime Zaion, O we ju eze na onye-nchu-àjà n'ọmuma nke iwe-Ya. 7 Onye-nwe-ayi ajusiwo ebe-ichu-àjà-Ya, Ọ sọwo ebe nsọ Ya oyi, O mechibidowo mb͕idi nile nke ulo-elu-ya nile nye n'aka onye-iro: Ha emewo ka olu-ha da udà n'ulo Jehova, dika n'ubọchi nke mb͕e akara àkà. 8 Jehova echèwo ibibi mb͕idi ada Zaion; O setiwo eriri, O sepughi aka-Ya n'olulo: O we me ka ékpè na mb͕idi rue újú; n'otù ka ha talatakọworo. 9 Ọnu-uzọ-ama-ya nile emikpuwo n'ala; O mewo ka ihe-ntuchi-ya nile la n'iyì, Ọ b͕ajiwo kwa ha: Eze-ya na ndi-isi-ya nọ n'etiti mba nile ebe iwu nādighi; Ọzọ, ndi-amuma-ya achọtaghi ọhù nke sitere na Jehova. 10 Ndi-okenye nke ada Zaion nānọdu ala, dere du; Ha ekpokwasiwo ájá n'isi-ha; ha ekewo ákwà-nkpe n'úkwù-ha: Umu-ab͕oghọ Jerusalem ndi nāmaghi nwoke erulatawo isi-ha n'ala. 11 Anyam abua adalawo n'isi site n'anya-miri, ngiri-afọm anuwom ọku, Awusiwo umejum n'ala dika miri, n'ihi ntipia nke ada ndim; N'ihi na umu-ntakiri na umu nke nāṅu ara nāda #mbà n'amá nile nke obodo. 12 Ha nāsi nne-ha, Òle ebe ọka na manya-vine di? Mb͕e ha nāda #mbà dika onye emeruru aru n'amá nile nke obodo, Mb͕e nkpuru-obi-ha nāwusi onwe-ya dika miri n'obi ndi bu nne-ha. 13 Gini, bu àmà M'gāb͕ara gi? gini ka M'gēji tuyere gi, gi ada Jerusalem? Gini ka M'gēme ka gi na ya rata, ka M'we kasie gi obi, gi ada Zaion nāmaghi nwoke? N'ihi na ihe di uku dika oké osimiri ka nb͕awa-gi bu: ònye gāgwọta gi? 14 Ndi-amuma-gi ahutaworo gi ọhù ihe-efu na ihe-nzuzu; Ma ha ekpugheghi ajọ omume-gi, ime ka ndi-gi adọtara n'agha lata: Kama ha ahutaworo gi ibu di iche iche nke ihe-efu na ihe-nchupu di iche iche. 15 Ndi nile ndi nāgabiga n'uzọ akuwo aka megide gi; Ha amawo ọsọ̀ fufere ada Jerusalem isi, si: Ọ̀ bu nka bu obodo ahu nke anākpọ Ebe mazuru nma, Ihe-obi-utọ nke uwa nile? 16 Ndi-iro-gi nile asaghepuwo ọnu-ha imegide gi; Ha amawo ọsọ̀, ta ikekere-ezé; ha asiwo, Ayi elodawo ya; N'ezie nka bu ubọchi ahu nke ayi lere anya ya; ayi achọtawo, ayi ahuwo. 17 Jehova emewo ihe nke O zubere; O mezuwo okwu-ọnu-Ya nke O nyere n'iwu site n'ubọchi nile nke mb͕e ochie; Ọ kwadawo, ghara inwe ọmiko: O we me ka onye-iro ṅuria ọṅu n'aru gi, O mewo ka mpi nke ndi nākpab͕u gi di elu. 18 Obi-ha tikuru Onye-nwe-ayi nkpu: Gi mb͕idi ada Zaion, me ka anya-miri rùda dika osimiri ehihie na abali; Enyela onwe-gi izu-ike; ka nwa-anya-gi ghara ikwusi akwusi. 19 Bilie, tie nkpu n'abali, na nmalite nche di iche iche; Wusi obi-gi dika miri na ncherita-iru Onye-nwe-ayi: Chilie aka-gi n'ebe Ọ nọ n'ihi ndu umu-ntakiri-gi, Ndi nāda #mbà n'agu n'isi èsí nile. 20 Le, Jehova, legide onye I meworo otú a anya! Ndinyom, hà gēri nkpuru-ha, bú umu-ntakiri anātughari n'aka? Àgēb͕u onye-nchu-àjà na onye-amuma n'ebe nsọ nke Onye-nwe-ayi? 21 Nwa-okoro na agadi-nwoke edinawo ala n'èzí nile; Umu-ab͕ọghọm nāmaghi nwoke na umu-okorọbiam adawo site na mma-agha: I b͕uwo ha n'ubọchi iwe-Gi; I b͕usiwo, I nweghi ọmiko. 22 I nākpọ, dika n'ubọchi nke mb͕e akara àkà, ujọm nile di buruburu, Ọ dighi kwa onye b͕apuru ab͕apu ma-ọbu onye fọduru afọdu n'ubọchi nke iwe Jehova: Umum ndi m'tughariworo n'aka zulite, onye-irom emewo ka ha gwusia.

Abù-Ákwá 3

1 Mu onwem bu nwoke ahu nke huworo nweda-n'ala site na nkpa-n'aka nke nrubiga-ókè nke iwe-Ya. 2 Mu ka O duworo me ka m'jegharia n'ọchichiri ghara inwe ìhè. 3 N'ezie, mu ka Ọ nātughari aka-Ya megide ọtutu mb͕e ogologo ubọchi nile. 4 O mewo ka anu-arum na akpukpọ-arum ka nká; Ọ b͕ajiwo ọkpukpum nile. 5 O wuwo ńsí na ike-ọgwugwu dika ulo imegidem, were ya b͕am buruburu. 6 N'ebe nile b͕ara ọchichiri ka O meworo ka m'biri, dika ndi nwuru anwu site na mb͕e ebighi-ebi. 7 Ọ b͕achiwom ogige, m'we ghara ipu apu; O mewo ka ọla eji kem ab͕u di arọ́. 8 Ọzọ, mb͕e m tikuru Chineke nkpu, O mechibido ekperem uzọ. 9 O werewo nkume awara awa b͕achie uzọm nile, okporo-uzọm nile ka O meworo ka ha b͕agọ ab͕agọ. 10 Bear nke nēche anwu ka Ọ burum, ma-ọbu ọdum nke nọ n'ebe-nzuzo di iche iche. 11 Uzọm nile ka O wezugaworo, O we dọbisiem; O mewom ka m'tọb͕ọrọ n'efu. 12 Ọ zọwo uta-Ya ukwu ikwe ya, O guzom dika ihe edotara ib͕a àkú. 13 O mewo ka àkú nile nke àkpà-àkú-Ya ba n'akurum abua. 14 Aghọworom ndim nile ihe-ọchi, na abù ha nābù n'ikpọ ubọ-akwara ogologo ubọchi nile. 15 O mewo ka ihe nile nke nēlu ilu jum afọ, O mewo ka m'ṅujue wormwood afọ. 16 O were umu nkume kujie ezém nile, Ọ turawom na ntu. 17 I juwo nkpuru-obim ka ọ ghara inọ n'udo; echezọwom ọdi-nma. 18 M'we si, Ikem alawo n'iyì, ya na ncherem nke sitere na Jehova. 19 Cheta nweda-n'alam na nwagharim, na wormwood na ńsí. 20 Nkpuru-obim nēcheta ha nke-ọma, we ruda n'ala nimem. 21 Nka ka m'nēweghachi n'obim, n'ihi nka ka m'nēchere. 22 O sitere n'ebere nile nke Jehova na emeghi ka ayi gwusia, n'ihi na obi-ebere-Ya nile agwughi. 23 Ha di ọhu kwa-ututu; ihe riri nne ka ikwesi-ntukwasi-obi-Gi bu. 24 Òkèm bu Jehova, ka nkpuru-obim siri; n'ihi nka ka m'gēchere Ya. 25 Jehova di nma n'ebe ndi nēle anya Ya nọ, Ọ di nma n'ebe nkpuru-obi nke nāchọ Ya nọ. 26 Ọ di nma ka madu chere nzọputa Jehova, dere kwa du n'ichere ya. 27 Ọ diri nwoke nma ka ọ nēbu yoke na mb͕e ọ di na nwata. 28 Ya nọdu náni ya iche, debe ọnu-ya du, n'ihi na Ọ tukwasiwo ya n'olu-ya. 29 Ya tiye ọnu-ya n'ájá; ma eleghi anya ọ di olile-anya gādi. 30 Ya mere ǹtì-ya nye onye nēti ya ihe; ka ita-uta ju ya afọ. 31 N'ihi na Onye-nwe-ayi agaghi-aju rue mb͕e ebighi-ebi. 32 N'ihi na ọ buru na O mekpa aru, ma Ọ gēnwe obi-ebere dika iba-uba nke ebere-Ya nile si di. 33 N'ihi na Ọ dighi-esite n'obi-Ya weda umu madu n'ala, mekpa ha aru. 34 Izọpia ndi-nkpọrọ nile nke uwa n'okpuru ukwu, 35 Iwezuga ikpé ọ bula n'iru Onye kachasi ihe nile elu, 36 Ime ka madu b͕agọ ab͕agọ n'okwu-ikpé-ya: Onye-nwe-ayi eleghi ihe ndia anya ọma. 37 Ònye bu onye ahu nke kwuworo okwu, o we rè, mgbe onyenwe-ayi enyeghi iwu? 38 Ọ̀ bughi n'ọnu Onye kachasi ihe nile ka ihe ọjọ na ezi ihe si aputa? 39 Gini mere madu nke di ndu ji atamu ntamu, onye ọ bula, bayere ahuhu nmehie-ya nile? 40 Ka ayi gwuputa ala uzọ nile ayi, nyochaputa ha, laghachikuru Jehova. 41 Ka ayi weliere Chineke Nke bi n'elu-igwe obi-ayi n'ọbu-aka-ayi abua. 42 Ayi onwe-ayi ejehiewo nupu kwa isi; Gi onwe-gi ab͕agharaghi. 43 I werewo iwe kpuchie Onwe-gi, we chua ayi; I b͕uwo, I nweghi ọmiko. 44 I werewo igwe-oji kpuchie Onwe-gi, ka ekpere-ayi we ghara igabiga. 45 Ihe azachapuru azachapu na ihe ajuru aju ka I nēme ayi n'etiti ndi nile di iche iche. 46 Ndi-iro-ayi nile asaghepuwo ọnu-ha imegide ayi. 47 Oké egwu na olùlù eruwo ayi aru, itọb͕ọ-n'efu na ntipia. 48 Ọtutu iyi nke juputara na miri ka anyam nērùda, n'ihi ntipia nke ada ndim. 49 Anyam nāwusi dika miri, ọ dighi-eguzo kwa du, ghara ikwusi akwusi, 50 Rue mb͕e Jehova gēsi n'elu-igwe lepu anya, hu. 51 Anyam nēme nkpuru-obim ihe, n'ihi umu-ndinyom nile nke obodom. 52 Ndi bu ndi-irom n'efu achusiwo ntám ike dika nnunu. 53 Ha ekpochapuwo ndum n'olùlù, we tuam nkume. 54 Miri rubigaram n'isi; asirim, Ebipuwom. 55 Esirim n'olùlù dichasi ala kpọkue aha-Gi, Jehova. 56 Olum ka I nuru; ezobela nti-Gi n'iku-umem, na ntikum. 57 I biaruru nso n'ubọchi m'kpọkuru Gi: I siri, Atula egwu. 58 Onye-nwe-ayi, I kpezuwo ọnu nke nkpuru-obim; I b͕aputawo ndum. 59 Jehova, I huwo nb͕agọm; Gi kpe ikpem. 60 I huwo ibọ̀-ọ́bọ̀ nile ha na èchìchè nile ha n'arum. 61 I nuwo ita-uta-ha, Jehova, na èchìchè nile ha megidem; 62 Eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi nēbili imegidem, na ntughari-obi-ha megidem ogologo ubọchi nile. 63 Legide inọdu-ala-ha, na nbili-ọtọ-ha; mu onwem bu abù ha nābù n'ikpọ ubọ-akwara. 64 I gēnyeghachi ha nmeso-ha, Jehova, dika ọlu aka-ha si di. 65 I gēnye ha ihe-nkpudo obi, bú ọb͕ub͕a-iyi I b͕ara ha. 66 I gāchu ha n'iwe, kpochapu ha n'okpuru elu-igwe nke Jehova.

Abù-Ákwá 4

1 Le, ka ọla-edo si echu echu nke-uku! le, ka ọla-edo nke makarisiri nma si ab͕anwe! Anāwusi nkume nile nke ebe nsọ n'isi èzí nile ọ bula. 2 Umu Zaion nke di oké ọnu-ahia, ndi eji turu ọla-edo anuchara anucha, Le otú aguworo ha n'ite urọ, bú ọlu aka ọkpu-ite! 3 Ọbuná nkita-ọhia eseputawo ara, me ka umu-ha ṅua ara: Ada ndim aghọwo onye nēnweghi obi-ebere, dika enyi-nnunu n'ọzara. 4 Iré nke nwa nke nāṅu ara araparawo n'okpo-ọnu-ya site n'akpiri-ikpọ-nku: Umu-ntakiri nāriọ nri, ma ọ dighi onye nēkesara ha. 5 Ndi nēri nání ihe utọ di iche iche tọb͕ọrọ n'efu n'èzí nile: Ndi azùputaworo n'uwe uhie amakuwo ebe-ikpofu-ahihia. 6 Ajọ omume nke ada ndim we di uku kari nmehie Sọdọm, Nke akwaturu dika n'otù ntabi-anya, ma ọ dighi aka ọ bula dakwasiri ya. 7 Ndi-Nazirait-ya di ọcha kari snow, ha nwuru enwu kari miri-ara-ehi, Ha chara ọbara-ọbara n'aru kari ruby, dika sapphire ka udi-ha di. 8 Udi-aru-ha ab͕awo ọchichiri kari iji-nji; amataghi ha n'èzí: Akpukpọ-ha araparawo n'ọkpukpu-ha; ọ kpọnwuwo, ọ ghọwo ihe di ka osisi. 9 Ndi mma-agha b͕uworo adiwo nma kari ndi agu gub͕uworo; N'ihi na ndia nērùpu dika miri, buru ndi adupuworo adupú, ghara inwe ihe-omume nke ubi. 10 Aka ndinyom ndi nwere obi-ebere esiwo umu-ha n'ite; Ha aghọworo ha ihe-oriri na ntipia nke ada ndim. 11 Jehova emezuwo ọmuma-Ya, Ọ wupuwo iwe-Ya di ọku; O we suye ọku nime Zaion, o we ripia ntọ-ala-ya nile. 12 Ndi-eze uwa ekweghi, ndi nile bi n'elu-uwa dum madu bi ekweghi kwa, Na onye-nkpab͕u na onye-iro gābà n'ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem. 13 O sitere na nmehie nile nke ndi-amuma-ya, na ajọ omume nile nke ndi-nchu-àjà-ya, Ndi nāwusi ọbara ndi ezi omume n'etiti ya. 14 Ha aṅaghariwo dika ndi-ìsì n'èzí nile, ejiwo ọbara meru ha, Madu we ghara inwe ike imetu uwe-ha aka. 15 Wezuganu onwe-unu, ka ha kpọrọ ha òkù, Onye ruru árú! wezuganu onwe-unu, wezuganu onwe-unu, unu emetula aka: Mb͕e ha b͕apuru ha ṅaghari-kwa-ra; madu siri n'etiti mba nile, Ha agaghi-anọ kwa ọnọdu-abali ọzọ n'ebe a. 16 Iru Jehova ekesawo ha; Ọ gaghi-elegide kwa ha anya ọzọ: Madu ahughi ndi-nchu-àjà iru-ọma, ha emeghi ndi-okenye amara. 17 Anya-ayi nādala n'isi rue ub͕u a n'ile anya iye-aka efu ayi: N'iche-nche-ayi ayi echewo nche mba nke nādighi-azọputa. 18 Ha achuwo ntá nzọ-ukwu nile ayi, ayi we ghara ijeghari n'amá nile ayi; Ọgwugwu-ayi di nso, ubọchi nile ayi eruzuwo; n'ihi na ọgwugwu-ayi abiawo. 19 Ndi nāchu ayi di garagara kari ugo nke elu-igwe: N'elu ugwu nile ka ha churu ayi n'ọku ọku, n'ọzara ka ha chere ayi anwu. 20 Ume nke oghere-imi-ayi, bú onye Jehova etere manu, ka ejidere n'olùlù-ha; Onye ayi siri, N'okpuru ǹdò-ya ka ayi gādi ndu n'etiti mba nile. 21 Ka obi nātọ gi utọ, ṅuria ọṅu, gi ada Edom, nke bi n'ala Uz: Ọbuná gi ka iko gāgabigaru: i gāṅubiga manya ókè, b͕aba onwe-gi ọtọ. 22 Ajọ omume-gi agwusiwo, gi ada Zaion; Ọ gaghi-eme kwa ọzọ ka i je biri n'ala ọzọ: Ọ gēleta ajọ omume-gi, gi ada Edom; Ọ gēkpughe nmehie-gi nile.

Abù-Ákwá 5

1 Jehova, cheta ihe ruworo ayi aru: Legide anya, hu ita-uta-ayi. 2 Ihe-nketa-ayi ab͕anwewo ihe ndi ala ọzọ, Ulo nile ab͕anwewo ihe ndi mba ọzọ. 3 Umu-nb͕ei ka ayi ghọworo, bú ndi nēnweghi nna, Nne-ayi-hà di ka ndinyom di-ha nwuru. 4 Miri-ayi ka ayi jiworo ego ṅua; Nkú-ayi nābiara ayi n'ọnu-ahia. 5 Ọ bu inọkwasi n'olu-ayi ka achuworo ayi: Ayi adọb͕uwo onwe-ayi n'ọlu, ma ekweghi ka ayi zuru ike. 6 Ijipt ka ayi kweyeworo ekweye, Ya na Asiria, ka nri we ju ayi afọ. 7 Nna-ayi-hà emehiewo, ha adighi kwa ndu; Ayi onwe-ayi eburuwo ajọ omume nile ha. 8 Ndi-orù achiwo ayi: Ọ dighi onye nānaputa ayi n'aka-ha. 9 Ayi ji ndu-ayi n'aka weta nri-ayiN'ihi mma-agha nke ọzara. 10 Akpukpọ-aru-ayi di ọku dika ite-ọku ukuSite n'ifufe di ọku nke oké ugwu. 11 Ndinyom nke di na Zaion ka ha wedara n'ala, Ha na umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke n'obodo nile nke Juda. 12 Ekobere ndi-isi n'aka-ha: Asọpughi iru ndi-okenye. 13 Umu-okorọbia buru nkume-igwe-nri, Umu-okoro su-kwa-ra ngọngọ n'okpuru nkú. 14 Ndi-okenye akwusiwo inọ n'ọnu-uzọ-ama, Umu-okorọbia akwusiwo ikpọ ubọ-akwara-ha. 15 Obi-utọ nke obi-ayi akwusiwo; Otite-egwú-ayi ab͕anwewo n'ib͕a-nkpe. 16 Okpu-eze nke isi-ayi adawo n'ala: Ahuhu nādiri ayi nọ̄! n'ihi na ayi emehiewo. 17 N'ihi nka ka aru nādighi obi-ayi nma; N'ihi ihe ndia ka anya-ayi b͕aworo ọchichiri. 18 N'ihi ugwu Zaion, nke tọb͕ọrọ n'efu; Nkita-ọhia ejeghariwo na ya. 19 Gi onwe-gi, Jehova, ọ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka I nānọdu dika eze; Oche-eze-Gi nādiru ọb͕ọ nile. 20 N'ìhi gini ka I nēchezọ ayi rue mb͕e ebighi-ebi? N'ìhi gini ka I nārapu ayi rue ogologo ubọchi nile? 21 Me ka ayi laghachikute Gi, Jehova, ayi gālata kwa; Me ka ubọchi nile ayi di ọhu dika na mb͕e ochie. 22 Ma-ọbughi na I jusiwo ayi, Wesa ayi iwe nke-uku.

Ezikiel 1

1 O rue, n'arọ nke-orú-na-iri, n'ọnwa nke-anọ, n'ubọchi nke-ise nke ọnwa ahu, mb͕e mu onwem nọ n'etiti ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ n'akuku osimiri Keba, na emeghere elu-igwe, m'we hu ọhù di iche iche nke Chineke. 2 N'ubọchi nke-ise nke ọnwa ahu, nke ahu bu arọ nke-ise nke emere ka Jehoiakim je biri n'ala ọzọ, 3 okwu Jehova ruru Ezikiel nwa Buzi, bú onye-nchu-àjà, nti n'ezie n'ala ndi Kaldea, n'akuku osimiri Keba; aka Jehova we di ya n'aru n'ebe ahu. 4 M'we hu, ma, le, oké ifufe nēsi n'Ugwu bia, oké igwe-oji, na ọku nke nānwude onwe-ya mb͕e nile, onwunwu di-kwa-ra ya buruburu, ọ bu kwa n'etiti ya, bú n'etiti ọku ahu, ka ihe dika amber n'ile ya anya nēb͕upu. 5 Ọzọ, n'etiti ya ka oyiyi nke ihe anọ di ndu si puta. Ma nka bu ka ha si di n'ile ha anya; oyiyi madu ka ha nwere. 6 Ọzọ, iru anọ ka onye ọ bula nime ha nwere, ọ bu kwa nkù anọ ka onye ọ bula nime ha nwere. 7 Ọzọ, ukwu nile ha bu ukwu guzoziri eguzozi; ọzọ, ọbu-ukwu nke ukwu nile ha di ka ọbu-ukwu nwa-ehi: ha neb͕u kwa maramara dika ib͕u-maramara ọla akwọchara akwọcha. 8 Ha nwe-kwa-ra aka madu n'okpuru nkù-ha n'akuku anọ ha: ọzọ, iru nile ha na nkù nile ha diri ha anọ otú a; 9 ihe ejikọtara ejikọta, otù na ibe-ya, ka nkù nile ha bu; ha adighi-agha anya n'azu mb͕e ha nāga; ha nāga n'iru, onye ọ bula na ncherita-iru ya. 10 Ma oyiyi iru nile ha, iru madu ka ha nwere; iru ọdum ka ha anọ nwe-kwa-ra n'aka-nri; iru ehi ka ha anọ nwe-kwa-ra n'aka-ekpe; iru ugo ka ha anọ nwe-kwa-ra. 11 Ọzọ, iru nile ha na nkù nile ha kewara ekewa site n'elu; onye ọ bula nwere nkù abua ejikọtara ejikọta, otù na ibe-ya, ma nkù abua nēkpuchi aru-ha. 12 Ọzọ, ha nāga n'iru, onye ọ bula na ncherita-iru ya: ebe ọ bula Mọ Chineke nwere ije ka ha nāga; ha adighi-agha anya n'azu mb͕e ha nāga. 13 Ma oyiyi nke ihe anọ ahu di ndu, ka ha si di n'ile ha anya, ha di ka icheku ọku nēre ọku, dika ọwa n'ile ha anya; ọku ahu nāga iru na azu n'etiti ihe anọ ahu di ndu: onwunwu di-kwa-ra ọku ahu, àmùmà nēsi kwa n'ọku ahu b͕uputa. 14 Ihe anọ ahu di ndu nāb͕a ọsọ nālaghachi kwa dika ob͕ub͕u-àmùmà si di n'ile ya anya. 15 M'we hu ihe anọ ahu di ndu, ma, le, otù wheel di n'ala n'akuku ihe ọ bula n'ihe anọ ahu di ndu, diri iru anọ ya n'otù n'otù. 16 Ka wheel nile ahu na otú emere ha si di n'ile ha anya, ha di ka ib͕u-maramara nkume beryl: ọ bu kwa otù oyiyi ka ha anọ nwere: ka ha na otú emere ha si di n'ile ha anya, ha di ka agāsi na ọ bu wheel n'etiti wheel. 17 Ọ bu n'akuku anọ ha ka ha nāga mb͕e ha nāga: ha adighi-agha anya n'azu mb͕e ha nāga. 18 Ma azu wheel nile ha, ha di elu, ha di kwa egwu; azu wheel nile ha juputara n'anya anya buruburu ha anọ. 19 Ma mb͕e ihe anọ ahu di ndu nāga, wheel-ha nāga n'akuku ha: ọzọ, mb͕e anēsi n'elu uwa buli ihe anọ ahu di ndu, anēbuli wheel-ha. 20 Ebe ọ bula Mọ Chineke nwere ije ka ha nāga; n'ebe ahu ka Mọ Chineke nwere ije: anēbuli kwa wheel-ha n'akuku ha: n'ihi na Mọ nke ihe ahu di ndu di nime wheel-ha. 21 Mb͕e ihe anọ ahu nāga, wheel nāga; ọ bu kwa mb͕e ihe anọ ahu nēguzo ka wheel nēguzo; ọ bu kwa mb͕e anēsi n'elu uwa bulie ihe anọ ahu ka anēbuli wheel-ha n'akuku ha: n'ihi na Mọ nke ihe ahu di ndu di nime wheel-ha. 22 Ọzọ, oyiyi nke mbara-ígwé di n'elu isi ihe ahu di ndu, dika ib͕u-maramara crystal di egwu si di, nke esetiri eseti n'elu isi-ha n'elu. 23 Ọzọ, n'okpuru mbara-ígwé ahu nkù nile ha guzoziri eguzozi, otù n'ebe ibe-ya di: ha nile n'otù n'otù nwere nkù abua nke nēkpuchi aru-ha n'otù akuku, ha nile n'otù n'otù nwe-kwa-ra nkù abua nke nēkpuchi aru-ha n'akuku ọzọ. 24 Mb͕e ha nāga m'we nu olu nkù nile ha, dika olu ọtutu miri, dika olu nke Onye puru ime ihe nile, olu nkpọtu dika olu ọmuma-ulo-ikwū: mb͕e ha guzoro, ha wuda nkù-ha. 25 Olu we di n'elu mbara-ígwé ahu nke di n'elu isi-ha: mb͕e ha guzoro, ha wuda nkù-ha. 26 Ọzọ, n'elu mbara-ígwé ahu nke di n'elu isi-ha oyiyi nke oche-eze di, dika nkume sapphire si di n'ile ya anya: ọzọ, n'elu oyiyi oche-eze ahu otù oyiyi di, nke di ka madu si di n'ile ya anya, n'elu oche-eze ahu n'elu. 27 M'we hu ihe di ka ib͕u-maramara amber, ihe di ka ọku si di n'ile ya anya nke di nime ya buruburu, site n'ihe bu úkwù-ya n'ile ya anya we rigo elu; ọzọ, site n'ihe bu úkwù-ya n'ile ya anya we ridata ahurum ihe nke di ka ọku si di n'ile ya anya, onwunwu-ọku di-kwa-ra ya buruburu. 28 Dika eke-na-ogwurugwu si di n'ile ya anya, bú nke di n'igwe-oji n'ubọchi nke miri-ozuzo, otú a ka onwunwu-ọku ahu si di n'ile ya anya, bú nke di ya buruburu. Nka bu ka oyiyi nke ebube Jehova si di n'ile ya anya. M'we hu ya, da kpue irum n'ala, m'we nu olu nke otù Onye nēkwu okwu.

Ezikiel 2

1 Ọ we sim, Nwa nke madu, guzo n'ukwu-gi abua, M'gāgwa kwa gi okwu. 2 Mọ Chineke we bata nimem mb͕e Ọ gwaram okwu, we me ka m'guzo n'ukwum abua; m'we nu otù Onye nāgwam okwu. 3 O we sim, Nwa nke madu, Mu onwem nēziga gi jekuru umu Israel, jekuru mba di iche iche ndi nānupu isi, ndi nupuworo isi n'okpurum: ha onwe-ha na ndi bu nna-ha ejehiewo megidem, rue n'ubọchi nke ta. 4 Umu-ha bu kwa ndi nēnweghi ihere n'iru, ndi obi-ha di ike; Mu onwem nēziga gi jekuru ha: i gāsi kwa ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova, siri. 5 Ma ha onwe-ha, ma ha gānu, ma ha gāghara, (n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu, ) ha gāmara na onye-amuma anọwo n'etiti ha. 6 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, atula egwu ha, atu-kwa-la egwu okwu nile ha, asi na ogwu na uke di n'ebe i nọ, asi kwa na ọ bu n'etiti akpi ka i bi: atula egwu okwu nile ha, atu-kwa-la ujọ iru-ha, n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu. 7 I gāgwa kwa ha okwum nile, ma ha gānu, ma ha gāghara: n'ihi na ndi nānupu isi nke-uku ka ha bu. 8 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, nu ihe Mu onwem nāgwa gi; abula onye nānupu isi dika ulo ahu nke nānupu isi: saghepu ọnu-gi, rie ihe ahu nke Mu onwem nēnye gi. 9 M'we hu, ma, le, otù aka nke esetipuru nyem; ma, le, nime ya ka akwukwọ-npiakọta di; 10 O we b͕asa ya n'irum; ma edere ya-ri ihe n'iru na azu: ma ihe edere ya-ri nime ya bu abù-ákwá di iche iche, na isu-udè, na ahuhu.

Ezikiel 3

1 O we sim, Nwa nke madu, ihe ahu nke i nāhu, rie ya; rie akwukwọ-npiakọta ahu, je, gwa ulo Israel okwu. 2 M'we saghepu ọnum, O we me ka m'rie akwukwọ-npiakọta ahu. 3 O we sim, Nwa nke madu, me ka afọ-gi rie, ọ bu kwa ngiri-afọ-gi nile ka i gēmeju n'akwukwọ-npiakọta nka nke Mu onwem nēnye gi. M'we rie; o we di n'ọnum dika manu-aṅu n'utọ. 4 O we sim, Nwa nke madu, je, ba n'ulo Israel, were okwum nile gwa ha. 5 N'ihi na ọ bughi ijekuru ndi asusu-ha miri emi nke ire-ha di kwa arọ́ ka ezigaworo gi onwe-gi, ma ọ bu ijekuru ulo Israel; 6 ọ bughi ijekuru ọtutu ndi asusu-ha miri emi nke ire-ha di kwa arọ́, ndi i dighi-anu okwu-ha. N'ezie, ọ buru na ọ bu ha ka M'zigara gi jekuru, ha onwe-ha gēge gi nti. 7 Ma ulo Israel agaghi-ekwe ige gi nti; n'ihi na ha adighi-ekwe igem nti: n'ihi na ulo Israel nile bu ndi nwere egedege-iru siri ike, ọ bu kwa ndi obi-ha siri ike ka ha bu. 8 Le, emewom iru-gi ka ọ di ike megide iru-ha, ọ bu kwa egedege-iru-gi ka M'meworo ka ọ di ike megide egedege-iru-ha. 9 Dika nkume adamant nke di ike kari ọmu, otú a ka M'meworo egedege-iru-gi: atula egwu ha, atu-kwa-la ujọ iru-ha, n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu. 10 O we sim, Nwa nke madu, okwum nile nke M'gāgwa gi, nara ha n'obi-gi, nuru kwa ha na nti-gi abua. 11 Je kwa, bakuru ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, bakuru umu ndi-gi, gwa ha okwu, si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri; ma ha gānu, ma ha gāghara. 12 Mọ Chineke we buliem, m'we nu olu nke oké ùzù n'azum, si, Ihe agọziworo agọzi ka ebube Jehova bu site n'ọnọdu-Ya. 13 M'we nu olu nke nkù nile nke ihe anọ ahu di ndu ka ha nēmeturita ibe-ha, na olu wheel nile nke di n'akuku ha, ọbuná olu nke oké ùzù. 14 Mọ Chineke we buliem, bupum: m'we jegharia n'ilu obi, n'ọnuma nke mọm, ọzọ, aka Jehova nke di n'arum di ike. 15 M'we biakute ndi ahu emere ka ha je biri n'ala ọzọ, na Tel-abib, bú ndi bi n'akuku osimiri Keba, m'we biarue ebe ha onwe-ha bi; m'we nọdu n'ebe ahu ubọchi asa n'anya o nējum n'etiti ha. 16 O rue, n'ọgwugwu ubọchi asa, na okwu Jehova rurum nti, si, 17 Nwa nke madu, Onye-nche ka M'doworo gi nye ulo Israel: i gānu kwa okwu site n'ọnum, dọ ha aka na nti site nam. 18 Mb͕e M'nāsi onye nēmebi iwu, I ghaghi inwu; ma i dọghi ya aka na nti, i kwughi kwa okwu idọ onye nēmebi iwu aka na nti ka o si n'uzọ nmebi-iwu ya puta, ime ka ọ di ndu; onye ahu nke nēmebi iwu gānwu n'ajọ omume-ya; ma n'aka-gi ka M'gājuta ọbara-ya. 19 Ma gi onwe-gi, mb͕e i gādọ onye nēmebi iwu aka na nti, ma o sighi na nmebi-iwu-ya na n'uzọ nmebi-iwu ya chigharia, onye ahu gānwu n'ajọ omume-ya; ma gi onwe-gi, nkpuru-obi-gi ka i naputaworo. 20 Ọzọ, mb͕e onye ezi omume si n'ezi omume-ya chigharia, we me ajọ omume, M'we tiye ihe-isu-ngọngọ n'iru ya, onye ahu gānwu; n'ihi na i dọghi ya aka na nti, ọ bu na nmehie-ya ka ọ gānwu, agaghi-echeta kwa ezi omume-ya nile nke o meworo; ma n'aka-gi ka M'gājuta ọbara-ya. 21 Ma gi onwe-gi, mb͕e i gādọ ya, bú onye ezi omume, aka na nti, ka onye ezi omume ghara imehie, onye ahu we ghara imehie, ọ ghaghi idi ndu, n'ihi na adọrọ ya aka na nti; ma gi onwe-gi, nkpuru-obi-gi ka i naputaworo. 22 Aka Jehova we dim n'aru n'ebe ahu; O we sim, Bilie, pua, jerue ndagwurugwu, n'ebe ahu ka M'gākpayere gi uka. 23 M'we bilie, pua, jerue ndagwurugwu ahu: ma, le, n'ebe ahu ka ebube Jehova nēguzo, dika ebube nke m'huru n'akuku osimiri Keba: m'we da kpue irum n'ala. 24 Mọ Chineke we bata nimem, me ka m'guzo n'ukwum abua; O we kpayerem uka, sim, Bia, mechibido onwe-gi uzọ n'etiti ulo-gi. 25 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, le, ha gātukwasi gi udọ̀ n'aru, chiri ha ke gi ab͕u, i gaghi-apu kwa n'èzí n'etiti ha: 26 M'gēme kwa ka ire-gi rapara n'okpo-ọnu-gi, i we ghọ ob͕i, ghara iburu ha onye nādọ aka na nti: n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu. 27 Ma mb͕e M'nākpayere gi uka, M'gēmeghe ọnu-gi, i we si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Onye nānu anu, ya nu; onye nāghara aghara, ya ghara: n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu.

Ezikiel 4

1 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, were n'onwe-gi otù brick, tọb͕ọ ya n'iru gi, kà otù obodo n'elu ya, bú Jerusalem: 2 tiye ihe-nnọchigide-n'agha imegide ya, wue ulo-agha imegide ya, wukọta obo-ihe imegide ya; tiye ọmuma-ulo-ikwū di iche iche imegide ya, do ihe di iche iche itipú mb͕idi imegide ya buruburu. 3 Gi onwe-gi were kwa n'onwe-gi ite ígwè ighe ihe, tiye ya ka ọ buru mb͕idi ígwè n'etiti gi na obodo ahu: che ya iru, ewe nānọchigide ya n'agha, i gānọchigide kwa ya n'agha. Ihe-iriba-ama ka ọ gāburu ulo Israel. 4 Ọzọ, gi onwe-gi were akuku aka-ekpe gi dina ala, tukwasi-ya ajọ omume ulo Israel: ka ọnu-ọgugu ubọchi ra nke i gēwere ya dina ala, i gēbu ajọ omume-ha. 5 Ma Mu onwem, edoworom i arọ nile nke ajọ omume-ha ibu ọnu-ọgugu ubọchi, bú ọgu ubọchi iri-na-iteghete na iri: i gēbu kwa ajọ omume nke ulo Israel. 6 Ọzọ, mb͕e i dinazuworo ubọchi ndia, i gēwere kwa akuku aka-nri gi dina ala, we buru ajọ omume nke ulo Juda: ọgu ubọchi abua, otù ubọchi n'ọnọdu otù arọ, ka M'nyeworo gi. 7 Ọ bu kwa n'ebe nnọchigide Jerusalem n'agha ahu di ka i gēche iru-gi, ogwe-aka-gi ab͕awo kwa ọtọ; i gēbu kwa amuma megide ya. 8 Ma, le, atukwasim i udọ̀, i we ghara isi n'otù akuku-aru-gi chighari n'akuku-aru-gi ọzọ, rue mb͕e i dinazuworo ubọchi nile nke nnọchigide-n'agha-gi. 9 Ọzọ, gi onwe-gi were n'onwe-gi ọka wheat, na ọka barley, na akidi, na lentil, na ọka millet, na spelt, tiye ha n'otù ihe, were ha mere onwe-gi achicha; ka ọnu-ọgugu ubọchi ra nke gi onwe-gi were akuku-gi dina ala, bú ọgu ubọchi iri-na-iteghete na iri, ka i gēri ya. 10 Ọzọ, ihe-oriri-gi nke i gēri, aganātù ya atù, orú shekel gādiri otù ubọchi: site n'otù mb͕e rue mb͕e ọzọ ka i gēri ya. 11 Ọ bu kwa miri nke anātù atù ka i gāṅu, otù uzọ n'uzọ iri nke otù hin: site n'otù mb͕e rue mb͕e ọzọ ka i gāṅu ya. 12 Ọzọ, dika ob͕e achicha barley ka i gēri ya, achicha ahu ka i gēji kwa ǹsí madu nyuru sie n'anya-ha. 13 Jehova we si, Ọbuná otú a ka umu Israel gēri nri-ha ruru árú, n'etiti mba nile ebe M'gāchuga ha. 14 M'we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! le, emerughi nkpuru-obim: erighkwam ihe nwuru n'onwe-ya, ma-ọbu ihe anu dọb͕uru, site na mb͕e m'di na nwata we rue ub͕u a; ọ dighi kwa anu nke bu ihe-árú bàworo n'ọnum. 15 O we sim, Le, enyewom i ǹsí ehi n'ọnọdu ǹsí madu, i gēme kwa achicha-gi n'elu ya. 16 O we sim, Nwa nke madu, le, M'gaje ib͕aji nkpa-n'aka, bú achicha, nime Jerusalem: ha ewe rie achicha n'ọtùtù na nime ncheb͕u; ha gāṅu kwa miri n'ọtùtù na n'anya ọ nēju ha: 17 ka nri na miri we kọ ha, ka o we ju kwa ha anya, otù onye n'aru ibe-ya, ha ewe ta aru n'ajọ omume-ha.

Ezikiel 5

1 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, were n'onwe-gi mma-agha di nkọ, dika aguba nke ndi nākọpu isi ka i gēwere ya n'onwe-gi, i gēme kwa ka ọ gabiga n'isi-gi na n'afu-ọnu-gi: i gēwere kwa n'onwe-gi ihe-ọtùtù itù atù, ke agiri-isi na afu-ọnu ahu. 2 Otù uzọ n'uzọ atọ ka i gēji ọku sure n'etiti obodo ahu, mb͕e ubọchi nile nke nnọchigide-n'agha ahu zuru ezu; i gēwere kwa otù uzọ n'uzọ atọ, were mma-agha ahu tie ya buruburu obodo ahu; otù uzọ n'uzọ atọ ka i gēfesara ifufe, ọ bu kwa mma-agha ka M'gāmiputa n'azu ha. 3 I gēweputa kwa n'ebe ahu agiri-isi di ole-na-ole n'ọnu-ọgugu, ke ha n'ọnu-ọnu-ala nke uwe-nwuda-gi. 4 Ọ bu kwa nime ndia ka i gēweputa kwa ufọdu ọzọ, tubà ha n'etiti ọku ahu, sure ha n'ọku; nime ya ka ọku gēsi pukuru ulo Israel nile. 5 Otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova, siri: Nka bu Jerusalem: n'etiti mba nile ka M'doworo ya, ala di iche iche di kwa ya buruburu. 6 O we nupu isi n'okpuru ikpém nile n'imebi iwu kari mba nile, na n'okpuru ukpurum nile karia ala nile nke di ya buruburu: n'ihi na ikpém nile ka ha juworo, ma ukpurum nile, ha ejegharighi nime ha. 7 N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova, ji si otú a: N'ihi na unu nātu ùzù kari mba nile nke di unu buruburu, unu we ghara ijeghari n'ukpurum nile, ghara kwa ime ihe nile M'kpere n'ikpe, ọ bughi kwa dika ikpé nile nke mba nile nke di unu buruburu si di ka unu meworo; 8 n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, Mu nēmegide gi, ọbuná Mu onwem; M'gēme kwa ihe nile nke ekpere n'ikpe n'etiti gi n'anya mba nile. 9 M'gēme kwa nime gi ihe ahu nke M'nēmeghi na mb͕e gara aga, nke M'nāgaghi-eme kwa ihe di ka ya ọzọ, n'ihi ihe-árú-gi nile. 10 N'ihi nka ka ndi bu nna gēri umu-ha n'etiti gi, umu gēri kwa ndi bu nna-ha; M'gēme kwa ihe nile ekpere n'ikpe nime gi, M'gāb͕asa kwa ndi-gi nile fọduru nye ifufe nile. 11 N'ihi nka, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), n'ihi na ebe nsọm ka i meruworo n'ihe-gi nile nke jọb͕uru onwe-ha, na n'ihe-árú-gi nile, n'ihi ya Mu onwem aghaghi kwa ibilata gi; anyam agaghi-eme kwa ebere; ọzọ kwa, Mu onwem agaghi-enwe ọmiko. 12 Otù uzọ n'uzọ atọ nime gi gānwu site n'ajọ ọria nēfe efe, ọ bu kwa site n'oké unwu ka ha gāgwusi n'etiti gi; otù uzọ n'uzọ atọ gāda site na mma-agha buruburu gi; ọzọ, otù uzọ n'uzọ atọ ka M'gāb͕asa nye ifufe nile, M'gāmiputa kwa mma-agha n'azu ha. 13 Ewe mezue iwem, M'gēme kwa ka ọnumam zuru ike n'aru ha, ewe kasiem obi: ha gāmara kwa na Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu n'ekworom, mb͕e M'gēmezuwori ọnumam n'aru ha. 14 Ọzọ, M'gēme gi ka i ghọ nkpọnkpọ ebe na ihe-ita-uta, n'etiti mba nile nke di gi buruburu, n'anya onye ọ bula nke nāgabiga. 15 Ọ gābu-kwa-ra mba nile nke di gi buruburu ihe-ita-uta, na ihe-nkwulu, na ihe-idọ-aka-na-nti, na ihe-iju-anya, mb͕e M'gēme ihe nile ekpere n'ikpe nime gi n'iwe, na n'ọnuma, na n'iba-nba nile nke ọnuma: Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo: 16 mb͕e M'gēziga àkú ọjọ nile nke oké unwu n'etiti ha, bú àkú nke diri nbibi, nke M'gēziga ibibi unu; ọ bu kwa oké unwu ka M'gātukwasiri unu, M'we b͕ajiere unu nkpa-n'aka, bú achicha; 17 M'gēzikwasi kwa unu oké unwu na ajọ anu-ọhia, ha gāb͕aba kwa unu aka nwa; ajọ ọria nēfe efe na ọbara gāgabiga kwa n'etiti gi; ọ bu kwa mma-agha ka M'gēme ka ọ biakwasi gi: Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo.

Ezikiel 6

1 Okwu Jehova we ruem nti, si, 2 Nwa nke madu, che iru-gi n'ugwu nile nke Israel, bu amuma megide ha, 3 si, Unu ugwu Israel, nurunu okwu Onye-nwe-ayi Jehova; Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri ugwu nile na ugwu ntà nile na ebe nile miri si erù na ndagwurugwu nile: Le, Mu onwem nēme ka mma-agha biakwasi unu, M'gēme kwa ka ha la n'iyì, bú ebe nile unu nke di elu. 4 Agēme kwa ka ebe-ichu-àjà nile unu tọb͕ọrọ n'efu, agētipia kwa arusi-anyanwu nile unu: M'gēme kwa ka ndi-unu eb͕uru eb͕u da n'iru arusi nile unu. 5 M'gātọb͕ọ kwa ozu nile nke umu Israel n'iru arusi nile ha; M'gātusa kwa ọkpukpu-unu buruburu ebe-ichu-àjà nile unu. 6 N'ebe-obibi nile unu ka agēme ka obodo nile ghọ nkpọnkpọ ebe, ebe nile di elu gātọb͕ọ kwa n'efu; ka ebe-ichu-àjà nile unu we ghọ nkpọnkpọ ebe, tọb͕ọrọ kwa n'efu, ka ewe tipia kwa arusi nile unu, ha ewe kwusi, ka ewe b͕utu kwa arusi-anyanwu nile unu, hichapu ọlu nile unu. 7 Onye eb͕uru eb͕u gāda kwa n'etiti unu, unu we mara na Mu onwem bu Jehova. 8 Ma M'gēme ka madu ufọdu fọdu, ọ bu na unu gēnwe ndi b͕apuru na mma-agha n'etiti mba nile, mb͕e unu gāb͕asa n'ala nile. 9 Ndi-unu b͕apuru ab͕apu gēcheta kwa Mu onwem n'etiti mba nile ebe adọtara ha n'agha, mb͕e M'tiwaworo obi-ha nke nākwa iko, nke siworo n'ebe M'nọ wezuga onwe-ya, na anya-ha, nke nākwaso arusi nile ha iko: ha gāsọ kwa onwe-ha oyi n'iru ha n'ihi ihe ọjọ nile nke ha meworo n'ihe-árú nile ha. 10 Ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova: ọ bughi n'efu ka M'kwuworo okwu, si na M'gēme ha ihe ọjọ a. 11 Otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova, siri: Kua ọbu-aka-gi, zọ kwa ukwu-gi n'ala, si, Éwù! n'ihi ihe-árú ọjọ nile nke ulo Israel: n'ihi na ha gēsite na mma-agha, site kwa n'oké unwu, site kwa n'ajọ ọria nke nēfe efe, da. 12 Onye nọ n'ebe di anya gēsite n'ajọ ọria nēfe efe nwua; onye nọ nso gēsite na mma-agha da; onye fọduru nke anānọchigide kwa n'agha gēsite n'oké unwu nwua: M'we mezue ọnumam n'aru ha. 13 Unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e ndi-ha eb͕uru eb͕u di n'etiti arusi nile ha buruburu ebe-ichu-àjà nile ha, n'ugwu ntà ọ bula di elu, na n'elu ugwu nile, na n'okpuru osisi ndu ọ bula, na n'okpuru osisi terebinth ọ bula b͕ara ọhia, bú ebe ha nyere arusi nile ha ihe ísì utọ. 14 M'gēseti kwa akam n'aru ha, me ka ala-ha ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu na ihe-iju-anya, site n'ọzara rue Dibla, n'ebe-obibi nile ha: ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

Ezikiel 7

1 Okwu Jehova we ruem nti, si, 2 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri ala Israel, Ọgwugwu: ọgwugwu abiakwasiwo nkuku anọ nke ala-unu. 3 Ub͕u a ka ọgwugwu dikwasi gi, M'gēzite kwa iwem n'aru gi, kpe gi ikpe dika uzọ-gi nile si di; M'gētiyekwasi kwa gi ihe-árú-gi nile. 4 Anyam agaghi-eme-kwa-ra gi ebere, M'gaghi-enwe kwa ọmiko: kama uzọ nile gi ka M'gētiyekwasi gi, ihe-árú-gi nile gādi kwa n'etiti gi: unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova. 5 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ihe ọjọ, otù ihe ọjọ; le, ọ biawo. 6 Ọgwugwu abiawo, ọgwugwu ahu abiawo, o tetawo n'ebe i nọ; le, ọ nābia. 7 Chi-ọbubọ abiakutewo gi, gi onye bi n'ala ahu: mb͕e nke gi abiawo, ubọchi nke gi di nso; ọ bu ọb͕ub͕a-aghara, ọ bughi iti-nkpu-ọṅù, n'elu ugwu-gi nile. 8 Ub͕u a na nwa mb͕e ntà ka M'gāwukwasi gi ọnumam, mezu kwa iwem imegide gi, kpe gi ikpe dika uzọ-gi nile si di; M'gētiyekwasi kwa gi ihe-árú-gi nile. 9 Anyam agaghi-enwe kwa ebere, M'gaghi-enwe kwa ọmiko: dika uzọ-gi nile si di ka M'gētiyekwasi gi ihe, ihe-árú-gi nile gādi kwa n'etiti gi; unu ewe mara na Mu onwem, bú Jehova, nētib͕u. 10 Le, ubọchi ahu, le, ọ nābia: chi-ọbubọ-gi aputawo; nkpa-n'aka ab͕awawo okoko, nganga amawo ifuru. 11 Ihe-ike ebiliwo ibu nkpa-n'aka nke nmebi-iwu; ọ dighi nke gāfodu nime ha, ma-ọbu nime ìgwè madu-ha, ma-ọbu nime ihe-ha: ọkaka adighi kwa n'etiti ha. 12 Mb͕e ahu abiawo, ubọchi ahu eruwo nso: ka onye nāzu azu ghara iṅuri ọṅu, ka onye nēre ere ghara kwa iru újú: n'ihi na iwe di ọku diri ìgwè madu-ya nile. 13 N'ihi na onye nēre ere agaghi-alaghachikute ihe erere, ọ bu ezie na ndu-ha nādi kwa n'etiti ndi di ndu: n'ihi na ọhù ahu diri ìgwè madu-ya nile, ọ gaghi-alaghachi; ọ dighi kwa onye ọ bula gēji ajọ omume nke ndu-ya me onwe-ya ka ọ di ike. 14 Ha afùwo opì-ha, dozie ihe nile; ma ọ dighi onye nēje agha: n'ihi na iwem nke di ọku nēmegide ìgwè madu-ya nile. 15 Mma-agha di n'èzí, ajọ ọria nke nēfe efe na oké unwu di kwa n'ulo: onye nọ n'ọhia gānwu na mma-agha; ọzọ, onye nọ n'obodo, oké unwu na ajọ ọria nēfe efe gērichapu ya. 16 Ma ndi-ha b͕apuru ab͕apu gāb͕apu, nọ n'ugwu nile dika nduru nke ndagwurugwu, ha nile nēkwo ákwá, onye ọ bula n'ajọ omume-ya. 17 Aka nile gākuda, ikperè nile gābu nání miri miri. 18 Ha gēke kwa ákwà-nkpe n'úkwù-ha, oké ọma-jijiji gēkpuchi kwa ha; ọ bu kwa iru nile ka ihere gēme, n'isi nile ha ka nkwọcha-isi gādi kwa. 19 Ọla-ọcha-ha ka ha gātufu n'èzí nile, ọla-edo-ha gāghọ kwa ihe-isọ-nsọ; ọla-ọcha-ha na ọla-edo-ha agaghi-enwe ike inaputa ha n'ubọchi nrubiga-ókè nke iwe Jehova; ha agaghi-eme ka afọ ju nkpuru-obi-ha, ha agaghi-emeju kwa ngiri-afọ-ha: n'ihi na ihe-isu-ngọngọ nke ajọ omume-ha ka ọ buworo. 20 Ma ima-nma nke ihe-ichọ-nma-ya, na nbili-elu ka o doro ya: ma onyinyo di iche iche nke ihe-árú nile ha na nke ihe nile ha nke jọb͕uru onwe-ha ka ha mere nime ya: n'ihi nka ka M'meworo ya ka ọ ghọrọ ha ihe-isọ-nsọ. 21 M'gēnye kwa ya n'aka ndi ala ọzọ ibu ihe-nluta-n'agha, M'gēwere kwa ya nye ndi-nmebi-iwu nke uwa ibu ihe-nkwata; ha gēmeru kwa ya. 22 M'gēsi kwa n'ebe ha nọ chigharia irum, ha gēme kwa ka ebe-nzuzom ghara idi nsọ: ndi nēme ihe-ike gābà kwa nime ya, me ka ọ ghara idi nsọ. 23 Me iyab͕a ahu: n'ihi na ala ahu juputara n'ikpé ọbara, obodo ahu juputa-kwa-ra n'ihe-ike. 24 M'gēme kwa ka ndi ọjọ nke mba di iche iche bia, ha ewe nweta ulo nile ha: M'gēme kwa ka npako nke ndi di ike kwusi; agēme kwa ka ebe nsọ nile ha ghara idi nsọ. 25 Nkpà abiawo; ha gāchọ kwa udo, ma ọ dighi. 26 Nbibi gēsochi nbibi bia, akukọ gānọchi kwa akukọ; ha gāchọ kwa ọhù n'aka onye-amuma; ma iwu gālanari onye-nchu-àjà n'iyì, ndum-ọdu gālanari kwa ndi-okenye n'iyì. 27 Eze-ha gēru kwa újú, onye-isi gēyiri itọb͕ọ-n'efu dika uwe, aka nile nke ndi ala ahu gāma kwa jijiji: dika uzọ-ha si di ka M'gēme ha, M'gēji kwa ikpé nile ha kpe ha; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

Ezikiel 8

1 O rue, n'arọ nke-isi, n'ọnwa nke-isi, n'ubọchi nke-ise nke ọnwa ahu, mb͕e mu onwem nānọdu ala n'ulom, mb͕e ndi-okenye Juda nānọdu kwa ala n'irum, na aka Onye-nwe-ayi Jehova dakwasirim n'ebe ahu. 2 M'we hu, ma, le, oyiyi dika ọku si di n'ile ya anya; site n'ihe bu úkwù-Ya n'ile ya anya we ridata, ọ bu ọku: ọzọ, site n'úkwù-Ya we rigo elu, ọ di ka onwunwu-ìhè si di n'ile ya anya, dika ib͕u-maramara amber. 3 O we setipu udi aka madu, jidem n'agiri-isi nke isim; Mọ Chineke we buliem elu n'etiti ala na elu-igwe, me ka m'bata Jerusalem n'ọhù nke Chineke, rue oghere nke ọnu-uzọ-ama nke ogige di nime nke nēche Ugwu iru; ebe ọnọdu ihe-oyiyi nke ekworo di, bú nke nākpasu ekworo. 4 Ma, le, n'ebe ahu ka ebube nke Chineke nke Israel di, dika ihe-ọhuhu ahu nke m'huru na ndagwurugwu. 5 O we sim, Nwa nke madu, biko, welie anya-gi le n'uzọ Ugwu. M'we welie anyam abua le n'uzọ Ugwu, ma, le, n'akuku Ugwu nke ọnu-uzọ-ama nke ebe-ichu-àjà ka ihe-oyiyi a nke ekworo di nime nbata. 6 O we sim, Nwa nke madu, Gì onwe-gi nāhu ihe ha onwe-ha nēme? bú ihe-árú nile di uku nke ulo Israel nēme n'ebe a, ka M'we si n'ebe nsọm je n'ebe di anya? ma i gāhu kwa oké ihe-árú ọzọ di iche iche. 7 O we me ka m'biarue ọnu-uzọ ogige ahu; m'we hu, ma, le, otù oghere di na mb͕idi ogige. 8 O we sim, Nwa nke madu, biko, gwue na mb͕idi a: m'we gwue na mb͕idi ahu, ma, le, otù ọnu-uzọ. 9 O we sim, Ba, hu ihe-árú ọjọ nile nke ha onwe-ha nēme n'ebe a. 10 M'we ba, hu; ma, le, udi nile ọ bula nke ihe nākpu akpu, na anumanu nke bu ihe-árú, na arusi nile nke ulo Israel, di, akàra na mb͕idi ahu buruburu n'ebe nile. 11 Ma ọgu ndikom atọ na iri nime ndi-okenye nke ulo Israel nēguzo n'iru ha, Jeazanaia nwa Shefan nēguzo kwa n'etiti ha, onye ọ bula o jide ihe-ya iji esure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'aka-ya; ísì utọ nke igwe-oji nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ anēsure we rigo. 12 O we sim, Nwa nke madu, ì huwo ihe ndi-okenye nke ulo Israel nēme n'ọchichiri, onye ọ bula n'ime-ulo nile nke ihe o mere ka ha yie ihe? n'ihi na ha nāsi, Ọ dighi Jehova nāhu ayi; Jehova arapuwo ala-ayi. 13 O we sim, I gāhu kwa oké ihe-árú ọzọ di iche iche nke ha onwe-ha nēme. 14 O we me ka m'biarue oghere ọnu-uzọ-ama nke ulo Jehova nke di n'akuku Ugwu; ma, le, n'ebe ahu ka ndinyom nānọdu ala nākwara Tamuz ákwá. 15 O we sim, Ì huwo, nwa nke madu? i gāhu kwa ihe-árú ọzọ di iche iche nke di uku kari ndia. 16 O we me ka m'ba nime ogige di nime nke ulo Jehova, ma, le, n'ọnu-uzọ ulo uku nke Jehova, n'etiti uzọ-nbata na ebe-ichu-àjà, ka ihe ra ka orú ndikom na ise nọ, b͕akuta ulo uku nke Jehova azu-ha, che iru-ha n'akuku Iru-anyanwu; ndi ahu nākpọ kwa isi ala nye anyanwu che Iru-anyanwu iru. 17 O we sim, Ì huwo, nwa nke madu? Ọ̀ buru ulo Juda ihe di nfe ime ihe-árú nile nke ha meworo n'ebe a? n'ihi na ha emejuwo ala-ha n'ihe-ike, we chigharia ikpasum iwe; ma, le, ha nēsetipu alaka rue imi-ha. 18 Ma Mu onwem gēmeso kwa ha n'ọnuma: anyam agaghi-enwe ebere, M'gaghi-enwe kwa ọmiko: ọ buru kwa na ha akpọ nkpu na ntim abua n'oké olu, ma M'gaghi-anu olu-ha.

Ezikiel 9

1 O we kpọ òkù na ntim abua n'oké olu, si, Bianu nso, unu ndi-nlekọta nke obodo, onye ọ bula ya jide kwa ihe o ji bibi madu n'aka-ya. 2 Ma, le, ndikom isi nēsi n'uzọ nke ọnu-uzọ-ama di n'elu, nke nēche iru n'Ugwu, bia, onye ọ bula nējide kwa anyu-ike-agha-ya n'aka-ya; otù nwoke ọzọ di kwa n'etiti ha nke yiri uwe ọcha, mpi ink nke ode-akwukwọ di kwa n'úkwù-ya. Ha we ba, guzo n'akuku ebe-ichu-àjà nke ọla. 3 Ma ebube nke Chineke nke Israel siri n'elu cherub ahu nke ọ di n'elu ya rigorue nbata-uzọ nke ulo ahu: O we kpọ nwoke ahu nke yiri uwe ọcha, nke nwere mpi ink nke ode-akwukwọ n'úkwù-ya, òkù. 4 Jehova we si ya, Gabiga n'etiti obodo a, n'etiti Jerusalem, ka akàrà n'egedege-iru nke ndi ahu ndi nēze ume ndi nāsu kwa ude n'ihi ihe-árú nile nke anēme n'etiti ya. 5 Ma ndikom isi ahu ka Ọ siri na ntim abua, Sonu ya gabiga n'obodo a, tib͕u kwa: anya-unu emela ebere, unu enwe-kwa-la ọmiko: 6 b͕usisianu okenye na okorọbia na nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke na umu-ntakiri na ndinyom: ma unu abiarula nso onye ọ bula nke akàrà ahu di ya n'iru; ma n'ebe nsọm ka unu gēsi malite. Ha we malite n'etiti ndi-okenye ndi nọ n'iru ulo ahu. 7 O we si ha, Meruanu ulo a, me ka ndi eb͕uru eb͕u ju ogige-ya nile: puanu. Ha we pua, tib͕ue n'obodo. 8 O rue, mb͕e ha nētib͕u, ma nání mu onwem fọduru, na adaram kpue irum n'ala, tie nkpu, si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! Ọ̀ bu onye-nbibi nke Israel nile ndi fọduru ka I gābu mb͕e I nāwukwasi Jerusalem ọnuma-Gi? 9 O we sim, Ajọ omume nke ulo Israel na Juda di uku ri nne, ala-ha juputa-kwa-ra n'ọbara, obodo a juputa-kwa-ra na nwezuga ikpé: n'ihi na ha siri, Jehova arapuwo ala nka, ọ dighi kwa Jehova nāhu ihe. 10 Ma Mu onwem kwa, anyam agaghi-enwe ebere, M'gaghi-enwe kwa ọmiko, uzọ-ha ka M'gētiyekwasi n'isi-ha. 11 Ma, le, nwoke ahu nke yiri uwe ọcha, nke nwere mpi ink n'úkwù-ya, nēweghachi okwu, si, Emewom dika I nyerem iwu.

Ezikiel 10

1 M'we hu, ma, le, nime mbara-ígwé ahu nke di n'elu isi cherubim, ihe dika nkume sapphire, dika oyiyi oche-eze si di n'ile ya anya, ka ahuru n'elu ha. 2 O we gwa nwoke ahu nke yiri uwe ọcha okwu, si, Ba n'etiti ihe ahu nākpọre, n'okpuru cherub, kpojue icheku ọku nēre ere n'aka-gi abua site n'etiti cherubim, fesa ha n'elu obodo a. O we ba n'etiti ha n'anyam. 3 Ma cherubim ahu nēguzo n'aka-nri nke ulo ahu, mb͕e nwoke ahu bàra; igwe-oji ahu juputa-kwa-ra ogige di nime. 4 Ebube Jehova we si n'elu cherub rigo, guzo n'elu nbata-uzọ nke ulo ahu; ulo ahu we juputa n'igwe-oji ahu; ogige-ya juputa-kwa-ra n'onwunwu-ìhè nke ebube Jehova. 5 Anu-kwa-ra olu nkù nile nke cherubim rue ogige di n'èzí, dika olu nke Chineke Nke puru ime ihe nile mb͕e Ọ nēkwu okwu. 6 O rue, mb͕e O nyere nwoke ahu nke yiri uwe ọcha iwu, si, Si n'etiti ihe nke nākpọre, si n'etiti cherubim, guputa ọku, na ọ bàra, guzo n'akuku wheel. 7 Cherub ahu we si n'etiti cherubim setipu aka-ya rue ọku ahu nke di n'etiti cherubim, were ufọdu tiye n'aka abua nke onye ahu nke yiri uwe ọcha, o we were ya pua. 8 Ewe hu n'aru cherubim udi nke aka madu n'okpuru nkù-ha. 9 M'we hu, ma, le, wheel anọ di n'akuku cherubim, otù wheel di n'akuku otù cherub, otù wheel di n'akuku otù cherub: wheel ahu n'ile ha anya di ka ib͕u-maramara nkume beryl si di. 10 Ma dika ha si di n'ile ha anya, otù oyiyi ka ha anọ nwere, dika agāsi na wheel di n'etiti wheel. 11 Mb͕e ha nāga, n'akuku anọ ha ka ha nāga: ha adighi-agha anya n'azu mb͕e ha nāga, kama n'ebe ahu nke isi-ha nēche iru, n'azu ya ka ha nāga; ha adighi-agha anya n'azu mb͕e ha nāga. 12 Anu-aru nile ha na azu-ha na aka-ha na nkù-ha na wheel-ha juputara n'anya anya buruburu, ọ bu ha anọ ka wheel nile ha diri. 13 Ma wheel anọ ahu, ha ka anākpọ na ntim abua, Ihe nākpọre. 14 Ma iru anọ diri cherub ọ bula nime ha: otù iru bu iru cherub ahu, iru nke-abua bu iru madu, nke-atọ bu iru ọdum, nke-anọ bu iru ugo. 15 Cherubim we bulie onwe-ha elu: nka bu ihe ahu nke di ndu nke m'huru n'akuku osimiri Keba. 16 Ma mb͕e cherubim nāga, wheel-ha nāga n'akuku ha: ọzọ, mb͕e cherubim nāchili nkù-ha isi n'elu uwa bulie onwe-ha elu, wheel-ha adighi-esi kwa n'akuku ha chigharia. 17 Mb͕e cherubim nēguzo, wheel nēguzo; mb͕e cherubim nēbuli onwe-ha elu, wheel soro ha buli onwe-ha elu: n'ihi na Mọ nke ihe ahu di ndu di nime ha. 18 Ebube Jehova we si n'elu nbata-uzọ nke ulo ahu pua, guzo n'elu cherubim. 19 Cherubim we chilie nkù-ha, si n'ala bulie onwe-ha elu n'anyam mb͕e ha puru, wheel nile ha di kwa n'akuku ha: ha we guzo n'oghere nke ọnu-uzọ-ama Iru-anyanwu nke ulo Jehova; ebube nke Chineke nke Israel di n'elu ha n'elu. 20 Nka bu ihe ahu di ndu nke m'huru n'okpuru Chineke nke Israel n'akuku osimiri Keba; m'we mara na cherubim ka ha bu. 21 Iru anọ iru anọ diri cherub ọ bula, nkù anọ di-kwa-ra cherub ọ bula; oyiyi nke aka madu di kwa n'okpuru nkù-ha. 22 Ma oyiyi nke iru-ha, ha onwe-ha bu iru nke m'huru n'akuku osimiri Keba, ka ha si di n'ile ha anya na ha onwe-ha; ha nāga n'iru, onye ọ bula na ncherita-iru ya.

Ezikiel 11

1 Mọ Chineke we buliem, me ka m'biarue ọnu-uzọ-ama Iru-anyanwu nke ulo Jehova, nke nēche iru n'Iru-anyanwu: ma, le, n'oghere nke ọnu-uzọ-ama ahu ka orú ndikom na ise nọ; m'we hu n'etiti ha Jeazanaia nwa Azua, na Pelataia nwa Benaia, bú ndi-isi nke ndi Israel. 2 Ọ we sim, Nwa nke madu, ndia bu ndikom ahu ndi nēchè ajọ ihe, ndi nādu kwa ọdu ọjọ n'obodo a: 3 ndi nāsi, Mb͕e iwu ulo adighi nso: obodo nka bu ite, ayi onwe-ayi bu kwa anu. 4 N'ihi nka bue amuma megide ha, bue amuma, nwa nke madu. 5 Mọ nke Jehova we dakwasim, O we sim, Si, Otú a ka Jehova siri: Otú a ka unu siri, unu ulo Israel; ọbuná ihe nile nke nābata nime mọ-unu, Mu onwem mara ya. 6 Unu emewo ka ndi-unu eb͕uru eb͕u n'obodo a ba uba, unu emejuwo kwa èzí nile ya na ndi eb͕uru eb͕u. 7 N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Ndi-unu eb͕uru eb͕u ndi unu tọb͕ọworo n'etiti ya, ha onwe-ha bu anu, obodo nka bu kwa ite: ma unu ka M'gēme ka unu si nime ya puta. 8 Mma-agha ka unu tuworo egwu ya; ọ bu kwa mma-agha ka M'gēme ka ọ biakwasi unu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 9 M'gēme kwa ka unu si n'etiti ya puta, M'gēnye kwa unu n'aka ndi ala ọzọ, me ihe nile ekpere n'ikpe n'etiti unu. 10 Site na mma-agha ka unu gāda; n'ókè-ala Israel ka M'gēkpe unu ikpe; unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova. 11 Obodo nka agaghi-aghọrọ unu ite, unu onwe-unu agaghi-aghọ kwa anu n'etiti ya; n'ókè-ala Israel ka M'gekpe unu ikpe; 12 unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova: n'ihi na n'ukpurum nile ka unu nējegharighi, ọ bu kwa ihe nile nke M'kpere n'ikpe ka unu nēmeghi, kama ọ bu dika ikpé nile nke mba nile nke di unu buruburu si di ka unu meworo. 13 O rue, mb͕e M'buru amuma, na Pelataia nwa Benaia nwuru. M'we da kpue irum n'ala, tie nkpu n'oké olu, si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! ọ̀ bu ka ndi Israel fọduru gwusia ka Gi onwe-gi nēme? 14 Okwu Jehova we ruem nti, si, 15 Nwa nke madu, umu-nne-gi, ọbuná umu-nne-gi, bú ndi-nb͕aputa-gi, na ulo Israel nile, ha nile, ọ bu ha ka ndi bi na Jerusalem siri, Sinu n'ebe Jehova nọ je n'ebe di anya; ọ bu ayi ka enyeworo ala nka ka ọ buru ihe-nnweta: 16 n'ihi nka si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ebe M'meworo ka ha je n'ebe di anya n'etiti mba nile, ebe M'chusawo-kwa-ra ha n'ala nile, M'gāghọ-kwa-ra ha ebe nsọ nwa mb͕e ntà n'ala nile ebe ha bàworo. 17 N'ihi nka si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: M'gāchikọputa unu nime ndi nile di iche iche, me kwa ka unu si n'ala nile ebe achusaworo unu zukọta, M'gēnye kwa unu ala Israel. 18 Ha gābà kwa n'ebe ahu, ha gēsi kwa na ya wezuga ihe-ya nile jọb͕uru onwe-ha, na ihe-árú-ya nile. 19 M'gēnye kwa ha otù obi, ọ bu kwa mọ ọhu ka M'gētiye nime unu; M'gēwezuga kwa obi nkume n'anu-aru-ha, nye ha obi anu-aru: 20 ka ha we jegharia n'ukpurum nile, debe kwa ikpém nile, me ha: ha gābu-kwa-ram otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra ha Chineke. 21 Ma ndi obi-ha nējeso obi nke ihe nile ha nke jọb͕uru onwe-ha na ihe-árú nile ha, uzọ-ha ka M'gātukwasi n'isi ha; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 22 Cherubim ahu we chilie nkù-ha, wheel nile ha di kwa n'akuku ha; ebube nke Chineke nke Israel di kwa n'elu ha n'elu. 23 Ebube Jehova we si n'etiti obodo ahu rigo, guzo n'elu ugwu ahu nke di n'akuku Iru-anyanwu nke obodo ahu. 24 Ma Mọ Chineke bulirim, me ka m'bata na Kaldea biakute ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, n'ọhuhu-ihe ahu nime Mọ Chineke. Ọhuhu-ihe ahu nke m'hururi we si n'ebe m'nọ rigo. 25 M'we gwa ndi ahu emere ka ha je biri n'ala ọzọ ihe nile nke Jehova mere ka m'hu.

Ezikiel 12

1 Okwu Jehova we ruem nti, si, 2 Nwa nke madu, n'etiti ulo nnupu-isi ahu ka i bi, bú ndi nwere anya ihu uzọ, ma ha ahughi, ndi nwere nti inu ihe, ma ha anughi; n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu. 3 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, mere onwe-gi ihe di iche iche nke ndi anēme ka ha je biri n'ala ọzọ, je biri n'ala ọzọ n'ehihie n'anya-ha; i gēsi kwa n'ọnọdu-gi je biri n'ebe ọzọ n'anya-ha: eleghi anya ha gāhu, n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu. 4 I gēbuputa kwa ihe-gi nile n'ehihie n'anya-ha, dika ihe nke ndi anēme ka ha je biri n'ala ọzọ: gi onwe-gi gāpu kwa n'anyasi n'anya-ha, dika ọpupu nke ndi anēme ka ha je biri n'ala ọzọ. 5 Gwupuere onwe-gi mb͕idi n'anya-ha, si n'ebe ahu bupu ihe. 6 N'anya-ha ka i gēbu ya n'ubu-gi, n'ọchichiri ka i gēbupu ya; iru-gi ka i gēkpuchi, ka i we ghara ihu ala: n'ihi na ewereworo gi nye ulo Israel ka i buru ihe-ebube. 7 M'we me otú a, dika enyerem iwu: ihem nile ka m'buputara n'ehihie, dika ihe nke ndi anēme ka ha je biri n'ala ọzọ, n'anyasi m'we ji akam gwupuere onwem mb͕idi; n'ọchichiri ka m'bupuru ya, n'ubum ka m'buru ya n'anya-ha. 8 Okwu Jehova we ruem nti n'ututu, si, 9 Nwa nke madu, hà asighi gi, bú ulo Israel, ulo nke nnupu-isi ahu, Gini ka gi onwe-gi nēme? 10 Si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Onye-isi nke nọ na Jerusalem ka eboro ibu a, ya na ulo Israel nile nke ndi ahu nọ n'etiti ha. 11 Si, Mu onwem bu ihe-ebube-unu: dika m'meworo, otú a ka agēme ha: ọ bu n'ime ka ha je biri n'ala ọzọ, n'idọta ha n'agha, ka ha gāla. 12 Onye-isi ahu kwa nke nọ n'etiti ha, n'ubu-ya ka o gēbu ihe n'ọchichiri, we pua: mb͕idi ka ha gēgwupú isi na ya bupu ihe: iru-ya ka o gēkpuchi, n'ihi na ya onwe-ya agaghi-eji anya-ya hu ala ahu. 13 M'gāb͕asa kwa ub͕um n'aru ya, agāma kwa ya n'ọnyàm: M'gēme kwa ka ọ biarue Babilon, bú ala ndi Kaldea; ma ala ahu ka ọ nāgaghi-ahu, ma n'ebe ahu ka ọ gānwu. 14 Ọ bu kwa ndi nile ndi di ya buruburu iyere ya aka, na usu-ndi-agha-ya nile, ka M'gēfesara ifufe nile ọ bula; ọ bu kwa mma-agha ka M'gāmiputa n'azu ha. 15 Ha gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'gāchusa ha n'etiti mba nile, fesa kwa ha n'ala nile. 16 Ma M'gēme ka ndikom ole-na-ole nime ha fọdu pua na mma-agha, na n'oké unwu, na n'ajọ ọria nēfe efe; ka ha we kọ akukọ ihe-árú nile ha n'etiti mba nile ebe ha gābiawori; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova. 17 Okwu Jehova we ruem nti, si, 18 Nwa nke madu, nri-gi ka i gēwere ime-nkpatu rie, miri-gi ka i gēwere kwa ọma-jijiji na ncheb͕u ṅua; 19 i gāsi kwa ndi ala nka, Okwu di otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova kwuru bayere ndi bi na Jerusalem, baye-kwa-ra ala Israel, si: Nri-ha ka ha gēwere ncheb͕u rie, miri-ha ka ha gēwere kwa iju-anya ṅua, ka ala-ya we tọb͕ọrọ n'efu ghara inwe ùjú-ya, site n'ihe-ike nke ndi nile bi nime ya. 20 Agēme kwa ka obodo-ya nile ebi ebi ghọ nkpọnkpọ ebe, ala gābu kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu, unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova. 21 Okwu Jehova we ruem nti, si, 22 Nwa nke madu, Gini bu ilu a unu nwere n'ala Israel, si, Ha di anya, bú ubọchi ahu, ọhù nile ọ bula alawo kwa n'iyì? 23 N'ihi nka si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: M'gēme ka ilu a kwusi, ha agaghi-atu kwa ya dika ilu n'Israel ọzọ; kama gwa ha okwu, si, Ha di nso, bú ubọchi ahu, ha na okwu ọhù ọ bula. 24 N'ihi na ọhù efu ọ bula, ma-ọbu iju-ase ire-utọ, agaghi-adi kwa n'etiti ulo Israel. 25 N'ihi na Mu onwem bu Jehova; M'gēkwu okwu, okwu nke M'gēkwu, agēme kwa ya; agaghi-eme kwa ya ka ọ di anya ọzọ: n'ihi na n'ubọchi-unu, unu ulo nke nnupu-isi, ka M'gēkwu okwu, me ya; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 26 Okwu Jehova we ruem nti, si, 27 Nwa nke madu, le, ulo Israel nāsi, Ọhù ahu nke ya onwe-ya nāhu diri ọtutu ubọchi di n'iru, ọ bu kwa mb͕e di anya ka ya onwe-ya nēburu amuma. 28 N'ihi nka si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ dighi okwu ọ bula n'okwum nile agēme kwa ka ọ di anya ọzọ, ma okwu nke M'gēkwu, agēme kwa ya; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

Ezikiel 13

1 Okwu Jehova we ruem nti, si, 2 Nwa nke madu, bue amuma megide ndi-amuma Israel ndi nēbu amuma, gi si ndi nēbu amuma si n'obi-ha puta, Nurunu okwu Jehova; 3 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ahuhu diri ndi-amuma nzuzu, ndi nējeso mọ nke ha, na ihe nke ha nāhughi! 4 Dika nkita-ọhia nime nkpọnkpọ ebe ka ndi-amuma-gi diworo, gi Israel. 5 Unu arigoghi na ntipú, unu ab͕aghi kwa ogige nye ulo Israel, iguzo n'agha n'ubọchi Jehova. 6 Ha ahuwo ọhù efu na iju-ase ugha, bú ndi nāsi, Ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta; ma Jehova eziteghi ha: ha we le anya na ha gēme ka okwu guzosie ike. 7 Ọ̀ bughi ọhù efu ka unu huworo, ọ̀ bughi kwa okwu iju-ase ugha ka unu kwuworo, mb͕e unu nāsi, Ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta; ma Mu onwem ekwughi okwu? 8 N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: N'ihi na unu ekwuwo okwu efu, hu ọhù ugha, n'ihi nka, le, Mu nēmegide unu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 9 Akam gādi kwa imegide ndi-amuma ahu ndi nāhu ọhù efu, ndi nāju kwa ase ugha: ha agaghi-adi n'ìzù nzuzo nke ndim, agaghi-ede kwa ha n'odide-akwukwọ ulo Israel, ha agaghi-abà kwa n'ala Israel; unu ewe mara na Mu onwem bu Onye-nwe-unu Jehova. 10 N'ihi na, ọ bu n'ihi na ha ewezugawo ndim, si, Udo; ma udo adighi; ndim ahu nālu kwa mb͕idi nādighi ike, ma, le, ha nēte ya nzu: 11 gi si ndi nēte ya nzu, na ọ gāda: oké miri-ozuzo nke nēzobiga ókè gēzo; unu onwe-unu kwa, oké ákú-miri-ígwé, gāda; oké ifufe gāb͕awa kwa ya. 12 Ma, le, mb͕idi ahu adawo, àgaghi-asi unu, Òle ebe otite ahu nke unu teworo? 13 N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a; M'gēwere kwa oké ifufe b͕awa ya n'ọnumam; oké miri-ozuzo nke nēzobiga ókè gēzo kwa n'iwem, na oké ákú-miri-ígwé n'ọnumam ime ka ọ gwusia. 14 M'gākwatu kwa mb͕idi ahu nke unu teworo nzu, M'gēme kwa ka ọ darue ala, ewe kpughepu ntọ-ala-ya: ọ gāda kwa, agēme kwa ka unu gwusia n'etiti ya; unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova. 15 Otú a ka M'gēmezu ọnumam n'aru mb͕idi ahu na n'aru ndi teworo ya nzu; M'gāsi kwa unu, Mb͕idi ahu adighi, ndi nēte ya adighi kwa; 16 bú ndi-amuma Israel ndi nēbu amuma bayere Jerusalem, ndi nāhu-kwa-ra ya ọhù udo, ma udo adighi; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 17 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, do iru-gi imegide umu-ndinyom nke ndi-gi, ndi nēbu amuma si n'obi-ha puta; gi bue amuma megide ha, 18 si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ahuhu diri ndinyom ndi nādukọta ohiri-isi n'elu nkwonkwo-aka nile, ndi nēme kwa ákwà-nb͕okwasi nye isi onye ọ bula ka ogologo-ya ra ichu ntá nkpuru-obi madu! ọ̀ bu nkpuru-obi nile nke ndim ka unu gāchu ntá, me kwa ka nkpuru-obi unu nwere di ndu? 19 Unu we me ka M'ghara idi nsọ n'etiti ndim n'ihi nju-aka ọka barley na n'ihi iberibe achicha, ime ka nkpuru-obi nwua, bú ndi nēkwesighi inwu anwu, na ime ka nkpuru-obi di ndu, bú ndi nēkwesighi idi ndu, site n'okwu-ugha unu nāgwa ndim ndi nānu okwu-ugha. 20 N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, Mu nēmegide ohiri-isi nile unu, nke unu onwe-unu ji achu ntá nkpuru-obi madu n'ebe ahu dika anu-ufe, M'gādọwapu kwa ha n'ogwe-aka-unu; M'gēzilaga kwa nkpuru-obi nile, bú nkpuru-obi unu onwe-unu nāchu ntá dika anu-ufe. 21 M'gādọwa kwa ákwà-nb͕okwasi nile unu, naputa ndim n'aka-unu, ha agaghi-adi kwa n'aka-unu ọzọ ichu ntá ha; unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova. 22 N'ihi na unu ji okwu-ugha mebie obi onye ezi omume, ma Mu onwem emeghi ka o b͕ue ya nb͕u; na n'ihi na unu mere ka aka abua nke onye nēmebi iwu di ike, ka o we ghara isi n'uzọ ọjọ ya lata, ime ka ọ di ndu: 23 n'ihi nka unu agaghi-ahu kwa ọhù efu ọzọ, unu agaghi-aju kwa ase ọzọ: M'gānaputa kwa ndim n'aka-unu; unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

Ezikiel 14

1 Ufọdu nime ndi-okenye Israel we biakutem, nọdu ala n'irum. 2 Okwu Jehova we ruem nti, si, 3 Nwa nke madu, ndikom ndia emewo ka arusi nile ha ba n'obi-ha, ọ bu kwa ihe-isu-ngọngọ nke ajọ omume-ha ka ha tiyere na ncherita-iru ha: #M'gēkwe ka ha juam ase ma-ọli? 4 N'ihi nka gwa ha okwu, si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Onye ọ bula n'ulo Israel nke nēme ka arusi nile ya ba n'obi-ya, nke nētiye kwa ihe-isu-ngọngọ nke ajọ omume-ya na ncherita-iru ya, we biakute onye-amuma; Mu onwem, bú Jehova, gāza ya dika o si di, ya bu dika iba-uba nke arusi-ya nile si di; 5 ka M'we jide ulo Israel n'obi-ha, n'ihi na ha esiwo n'ebe M'nọ ghọ ndi ala ọzọ site n'arusi nile ha. 6 N'ihi nka si ulo Israel, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Latanu, sinu n'arusi nile unu chigharia; si-kwa-nu n'ihe-árú nile unu chigharia iru-unu. 7 N'ihi na onye ọ bula n'ulo Israel, ma-ọbu onye ọ bula nime ndi-ọbìa nke nọ dika ọbìa n'Israel, nke nēkewapu onwe-ya n'isom, we me ka arusi nile ya ba n'obi-ya, nke nētiye kwa ihe-isu-ngọngọ nke ajọ omume-ya na ncherita-iru ya, we biakute onye-amuma iju ase bayerem n'aka ya; Mu onwem, bú Jehova, gāza ya n'Onwem: 8 M'gēdo kwa irum megide onye ahu, me ya ka ọ buru ihe-iju-anya, ka ọ ghọ ihe-iriba-ama na ilu, M'gēbipu kwa ya n'etiti ndim; unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova. 9 Ma onye-amuma ahu, mb͕e agārafu ya, o we kwue okwu, Mu onwem, bú Jehova, arafuwo onye-amuma ahu, M'gēsetipu kwa akam n'aru ya, kpochapu ya n'etiti ndim, bú Israel. 10 Ha gēbu kwa ajọ omume-ha: dika ajọ omume nke onye nāju ase, otú a ka ajọ omume nke onye-amuma gādi; 11 ka ulo Israel we ghara ikpafu kwa ọzọ n'isom, ghara kwa iwere njehie nile ha merua onwe-ha ọzọ; ha ewe ghọrọm otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra ha Chineke; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 12 Okwu Jehova we ruem nti, si, 13 Nwa nke madu, mb͕e ala ọ bula nēmehie megidem n'imekpu ihe-nmekpu, M'we setipu akam imegide ya, b͕ajiere ya nkpa-n'aka, bú achicha, zite oké unwu nime ya, bipu madu na anumanu nime ya; 14 asi na ndikom atọ ndia, bú Noa na Daniel na Job, nọ n'etiti ya, ha onwe-ha gēji ezi omume-ha naputa nání nkpuru-obi-ha; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 15 Asi na emem ka ajọ anu-ọhia gabiga n'ala ahu, ha we b͕aba ya aka, o we ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ghara inwe onye ọ bula nāgabiga ya n'ihi anu-ọhia ahu; 16 asi na ndikom atọ ndia nọ n'etiti ya, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), ọ dighi umu-ndikom ọ dighi kwa umu-ndinyom ha gānaputa ma-ọli; ha onwe-ha, nání ha, ka agānaputa, ma ala ahu gāghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu. 17 Ma-ọbu, asi na ọ bu mma-agha ka M'nēme ka ọ biakwasi ala ahu, M'we si, Ka mma-agha gabiga n'ala nka; M'we bipu madu na anumanu nime ya; 18 asi na ndikom atọ ndia nọ n'etiti ya, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), ha agaghi-anaputa umu-ndikom na umu-ndinyom, kama ha onwe-ha, nání ha, ka agānaputa. 19 Ma-ọbu asi na ọ bu ajọ ọria nēfe efe ka M'nēziga n'ala ahu, M'we wukwasi ya ọnumam n'ọbara, ibipu madu na anumanu nime ya: 20 asi na Noa na Daniel na Job nọ n'etiti ya, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), ọ dighi nwa-nwoke ma-ọbu nwa-nwayi ha gānaputa ma-ọli; ha onwe-ha gēji ezi omume-ha naputa nání nkpuru-obi-ha. 21 N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Àgēsi kwa aṅa naputa ya ma-ọli mb͕e ọ bu ikpém anọ jọrọ njọ, bú mma-agha na oké unwu na ajọ anu-ọhia na ajọ ọria nēfe efe, ka M'zigara na Jerusalem, ibipu madu na anumanu nime ya? 22 Ma, le, ndi b͕apuru ab͕apu gāfọdu nime ya, ndi anēme ka ha puta, bú umu-ndikom na umu-ndinyom: le, ha nāpukute unu, unu gāhu kwa uzọ-ha na omume nile ha: ewe kasie unu obi bayere ihe ọjọ ahu nke M'meworo ka ọ biakwasi Jerusalem, bú ihe ahu nile nke M'meworo Ka ọ biakwasi ya. 23 Ha gākasi kwa unu obi, mb͕e unu nāhu uzọ-ha na omume nile ha: unu ewe mara na ọ bughi n'efu ka M'meworo ihe ahu nile nke M'meworo nime ya; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

Ezikiel 15

1 Okwu Jehova we ruem nti, si, 2 Nwa nke madu, gini ka osisi vine bu kari osisi ọ bula, bú alaka vine nke diworo n'etiti osisi nile nke oké ọhia? 3 Àgēsi nime ya were osisi ime ihe ije ozi? ma-ọbu àgēsi nime ya were nkpukpọ ikokwasi ihe ọ bula n'elu ya? 4 Le, n'ọku ka atubàworo ya ibu nri-ya: isi-ya abua ka ọku ripiaworo, etiti-ya anujiwo kwa; ọ̀ gābà n'ije-ozi ọ bula? 5 Le, mb͕e o zuru okè, adighi-ewere ya me ihe ije ozi: àgēsi kwa aṅa were ya me ihe ije ozi ọzọ, mb͕e ọku ripiaworo ya, o we nujie? 6 N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: dika osisi vine si di n'etiti osisi oké ọhia, nke M'nyeworo ọku ibu nri-ya, otú a ka M'nyeworo ndi bi na Jerusalem. 7 M'gēche kwa irum imegide ha; ọku ka ha siworo puta, ma ọku gēripia ha; unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'doro irum imegide ha. 8 M'gēme kwa ka ala-ha ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, n'ihi na ha emekpuwo ihe-nmekpu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

Ezikiel 16

1 Okwu Jehova we ruem nti, si, 2 Nwa nke madu, me ka Jerusalem mara ihe-árú-ya nile, 3 si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri Jerusalem: Nputa-uwa-gi na ọmumu-gi sitere n'ala ndi Kenean; nna-gi ka onye-Amorait bu, ọ bu kwa nne-gi ka onye Het bu. 4 Ma ọmumu-gi, n'ubọchi amuru gi ebìghi otubo-gi, ejighi kwa miri sa gi aru isacha gi; eteghi i nnú ma-ọli, ekeghi kwa gi ákwà-ọkiké ma-ọli. 5 Ọ dighi anya mere gi ebere, imere gi otù ihe n'ihe ndia, inwe ọmiko n'aru gi; ma atufuru gi n'ọhia, n'ihi na asọwo gi onwe-gi oyi n'ubọchi amuru gi. 6 M'we gabiga n'akuku gi, hu gi ka anāzọtọ gi n'ọbara-gi, M'we si gi, Ọ bu ezie na i nọ nime ọbara-gi, di ndu; e, asirim gi, Ọ bu ezie na i nọ nime ọbara-gi, di ndu. 7 Ihe bara uba dika ihe-opupú nke ọhia ka M'meworo gi, i we ba uba, bùe ibù, biarue n'ihe-ichọ-nma kachasi ihe-ichọ-nma nile; i kpuru ara, agiri-isi-gi puchi-kwa-ra epuchi; ma gi onwe-gi b͕asiri ọtọ. 8 M'we gabiga n'akuku gi, hu gi, ma, le, mb͕e-gi bu mb͕e ihe-gi nātọ utọ; M'we b͕asa ọnu-ọnu-ala uwe-nwudam n'aru gi, kpuchie ọtọ-gi, ṅuara gi iyi, Mu na i we b͕a ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), i we ghọ onye nkem. 9 M'we sa gi miri, sachapu ọbara-gi n'aru gi, te gi manu. 10 M'we yibe gi uwe akpara nke-ọma, yibe gi akpukpọ seal n'ukwu, chiri ezi ákwà ọcha ke gi n'úkwù, b͕okwasi gi nkisi. 11 M'we ke gi ihe-ichọ-nma, tiye ọla-aka n'aka-gi abua, na iyab͕a n'olu-gi. 12 M'we tiye nb͕a-aka n'imi-gi, na nb͕a-aka-nti na nti-gi abua, na okpu-eze mara nma n'isi-gi. 13 Ewe ke gi ihe-ichọ-nma nke ọla-edo na ọla-ọcha; uwe-oyiyi-gi bu kwa ezi ákwà ọcha na nkisi na uwe akpara nke-ọma; utu ọka flour na manu-aṅu na manu ka i riri: i we mab͕ue onwe-gi na nma, o we gara gi nke-ọma, i we rue ala-eze. 14 Aha i nwere we pua ba n'etiti mba nile n'ihi nma-gi; n'ihi na ihe zuru okè ka ọ bu, n'ihi ima-nmam nke M'tukwasiri gi; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 15 I we tukwasi nma-gi obi, kwa iko n'ihi aha-gi, wukwasi ikwa-iko-gi nile n'aru onye ọ bula nāgabiga; nke ya ka ọ bu. 16 I we chiri uwe-gi ufọdu, mere onwe-gi ebe di iche iche di elu nke aturu agwa, i we kwa iko n'elu ha: ihe di otú a ekwesighi ibia, ọ gaghi-adi kwa otú a. 17 I we chiri ihe-gi nile mara nma nke sitere n'ọla-edom na n'ọla-ọcham, nke M'nyere gi, i we mere onwe-gi onyinyo di iche iche nke nwoke, kwaso ha iko, 18 chiri uwe-gi nke akpara nke-ọma, kpuchie ha, ọ bu kwa manum na ihe-nsure-ọkum nēsì ísì utọ ka i chere n'iru ha. 19 Nrim kwa nke M'nyere gi, bú utu ọka flour na manu na manu-aṅu, nke M'mere ka i rie, i che-kwa-ra ya n'iru ha ibu ísì utọ, o we di otú a; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 20 I we chiri umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom, ndi i muworom, i we chiri ha chuara ha àjà, ka ewe ripia ha. Ọ̀ bu ihe ntà, bú okwu ikwa-iko-gi nile, 21 na i b͕uworo umum, rara ha nye, n'ime ka ha gabigakuru ha n'ọku? 22 Ma n'ihe-árú-gi nile na ikwa-iko-gi nile i chetaghi ubọchi nile mb͕e i di na nwata, mb͕e i b͕asiri ọtọ, onye anāzọtọ n'ọbara-gi ka i bu kwa. 23 O rue, mb͕e ihe ọjọ gi nile gasiri, (ahuhu, ahuhu diri gi! ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta, ) 24 na i wuworo onwe-gi ulo ikwa iko, me-kwa-ra onwe-gi ebe di elu n'amá nile ọ bula. 25 N'isi-uzọ nile ọ bula ka i wuworo ebe-gi di elu, i we me ka nma-gi ghọ ihe-árú, i we ghebere onye-ngabiga ọ bula ukwu-gi abua, me ka ikwa-iko-gi ba uba. 26 I we kwaso umu Ijipt, bú ndi-ab͕ata-obi-gi, ndi anu-aru-ha di uku, iko, me ka ikwa-iko-gi ba uba, ikpasum iwe. 27 Ma, le, esetiwom akam imegide gi, M'we bilata òkè nri-gi, rara gi nye n'aka ọchichọ nkpuru-obi ndi nākpọ gi asì, bú umu-ndinyom ndi Filistia, ndi ihere uzọ ajọ nzube gi mere. 28 I we kwaso umu Asiria iko, n'ihi na afọ ejughi gi; e, i kwasoro ha iko, ma afọ ejughi kwa gi. 29 I we me ka ikwa-iko-gi ba uba n'ebe ala ndi-ahia di, rue Kaldea; ma ọbuná na nka ka afọ nējughi gi. 30 Le, ka obi-gi si ata aru nke-uku! (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), ọ bu na i nēme ihe ndia nile, bú ọlu nwanyi nākwa iko nke nēme ka o si tọ ya; 31 ọ bu na i nēwu ulo ikwa-iko gi n'isi uzọ nile ọ bula, ebe-gi di elu ka i mewo-kwa-ra n'amá nile ọ bula; ma i dighi ka nwanyi nākwa iko n'ichì onyinye ọchì. 32 Le nwanyi nākwa iko! mb͕e ọ nọ n'okpuru di-ya ọ nēwere ndi nābughi di-ya! 33 Ndinyom nile nke nākwa iko ka ha nēnye onyinye: ma gi onwe-gi enyewo ndikom nile nāhu gi n'anya onyinye-gi nile, i we go ha ngo, ka ha si n'ebe nile di buruburu biakute gi n'ihi ikwa-iko-gi nile. 34 Gi na ndinyom ọzọ we di iche n'ikwa-iko-gi nile otú a, na ọ dighi onye nākwaso gi iko: na ebe i nēnye onyinye, ma ọ dighi onyinye enyeworo gi, i we ghọ onye di iche. 35 N'ihi nka, gi nwanyi nākwa iko, nuru okwu Jehova: 36 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri, N'ihi na awusiwo ọla-gi, na n'ihi na ekpughepuru ọtọ-gi site n'ikwa-iko-gi nile i nākwaso ndi nāhu gi n'anya; na n'ihi arusi nile nke ihe-árú-gi nile, na dika ọbara umu-gi si di, nke i nyere ha; 37 n'ihi nka, le, M'gaje ichikọta ndi nile nāhu gi n'anya, ndi ihe-gi nātọ ha utọ, na ndi nile i huworo n'anya, ha na ndi nile i kpọworo asì; ọ bu na M'gāchikọta ha imegide gi buruburu, M'gēkpughe-kwa-ra ha ọtọ-gi, ka ha we hu ọtọ-gi nile. 38 M'gēkpe kwa gi ikpe nile nke ndi bu nwunye nākwa iko, ndi nāwusi kwa ọbara; M'gēwere kwa gi nye ka i buru ọbara nke ọnuma na nke ekworo. 39 M'gēnye kwa gi n'aka-ha, ha ewe kwatue ulo ikwa-iko gi, tikpọ ebe-gi nile di elu, yipu uwe-gi nile n'aru-gi, chiri ihe-gi nile mara nma: ha gārapu gi i b͕arasia ọtọ. 40 Ha gēme kwa ka nkpọkọta rigota imegide gi, ha gēwere kwa nkume tub͕ue gi, were mma-agha-ha dupue gi. 41 Ha gēsure kwa ulo-gi nile n'ọku, meso gi ihe nile ekpere n'ikpe n'anya ọtutu ndinyom; M'gēme kwa ka i kwusi ikwa iko; ọzọ, i gaghi-enye kwa onyinye ọzọ. 42 M'gēme kwa ka ọnumam zuru ike n'aru gi, ekworom gēsi kwa n'aru gi wezuga onwe-ya, M'gānọ kwa jū, ghara iwe iwe ọzọ. 43 N'ihi na i chetaghi ubọchi nile nke mb͕e i di na nwata, i we mekpam aru n'ihe ndia nile; n'ihi ya, le, Mu onwem gētiyekwasi kwa uzọ-gi n'isi-gi, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta): ì meghi kwa ajọ ihe-nzube a tukwasi n'ihe-árú-gi nile? 44 Le, onye ọ bula nātu ilu gātu ilu bayere gi, si, Dika nne si di, otú a ka nwa-ya nwanyi di. 45 Nwa-nwanyi nke nne-gi ka i bu, nke nāsọ di-ya na umu-ya oyi; ọ bu kwa nwa-nne nke umu-nne-gi ndinyom ka i bu, ndi sọrọ di-ha na umu-ha oyi: nne-unu bu onye Het, nna-unu bu kwa onye-Amorait. 46 Nwa-nne-gi nwanyi nke-okenye bu Sameria, nke bi n'aka-ekpe-gi, ya onwe-ya na umu-ya ndinyom: nwa-nne-gi nwanyi nke-ntà, nke bi n'aka-nri-gi, bu Sọdọm na umu-ya ndinyom. 47 Ma ọ bughi n'uzọ di iche iche ha ka i jeworo ije, ọ bughi kwa dika ihe-árú nile ha si di ka i meworo; kama, dika agāsi na nke ahu bu nọ̄ ihe ntà, i we bibie onwe-gi kari ha n'uzọ-gi nile. 48 Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), Sọdọm, bú nwa-nne-gi nwanyi, emeghi, ya onwe-ya ma-ọbu umu-ya ndinyom, otú i meworo, gi onwe-gi na umu-gi ndinyom. 49 Le, nka bu ajọ omume nke Sọdọm, bú nwa-nne-gi nwanyi; npako, na afọ ojuju nri, na udo nke inọ-jū, diri ya na umu-ya ndinyom; ma o meghi ka aka nke onye ewedara n'ala na ob͕eye di ike. 50 Ha we di elu n'obi, me ihe-árú n'irum: M'we wezuga ha mb͕e M'huru ya. 51 Sameria kwa, ọ bughi ka nkera nke nmehie-gi nile ra ka o meworo; i we me ka ihe-árú-gi ba uba kari nke ha, i we gua umu-nne-gi ndinyom na ndi ezi omume site n'ihe-árú-gi nile nke i meworo. 52 Gi onwe-gi kwa, būru ihere-gi, ebe i kpeworo uche-gi bayere umu-nne-gi ndinyom; site na nmehie-gi nile nke i meworo ihe-árú na ha kari ha, ha bu ndi ezi omume kari gi: e, gi onwe-gi kwa, ka ihere me gi, būru kwa ọnọdu-ihere-gi, n'ihi na i guworo umu-nne-gi ndinyom na ndi ezi omume. 53 M'gēme kwa ka ndọta-n'agha-ha chigharia, bú ndọta-n'agha nke Sọdọm na umu-ya ndinyom, na ndọta-n'agha nke Sameria na umu-ya ndinyom, na ndọta-n'agha nke ndi-gi adọtara n'agha n'etiti ha: 54 Ka i we būru ọnọdu-ihere-gi, ka ihere we me kwa gi n'ihi ihe nile nke i meworo, n'ikasi ha obi. 55 Umu-nne-gi ndinyom, bú Sọdọm na umu-ya ndinyom, gēchighata n'ọnọdu mb͕e ochie ha, Sameria na umu-ya ndinyom gēchighata kwa n'ọnọdu mb͕e ochie ha, gi onwe-gi na umu-gi ndinyom gēchighata kwa n'ọnọdu mb͕e ochie unu. 56 Ma Sọdọm, bú nwa-nne-gi nwanyi, abughi aha anuru n'ọnu-gi n'ubọchi npako-gi; 57 tutu ekpughe ihe ọjọ gi, dika na mb͕e ita-uta nke umu-ndinyom Siria, na nke ndi nile nọ ya buruburu, bú umu-ndinyom nke ndi Filistia, ndi nāzọpia gi buruburu. 58 Ajọ ihe-nzube-gi na ihe-árú-gi nile ka gi onwe-gi buruworo; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 59 N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Emesowom i ọbuná otú i meworo, gi onye ledaworo ọb͕ub͕a-iyi anya n'imebi ọb͕ub͕a-ndu. 60 Ma Mu onwem gēcheta ọb͕ub͕a-ndu Mu na gi b͕ara n'ubọchi mb͕e i di na nwata, M'gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi guzosiere gi ike. 61 I gēcheta kwa uzọ-gi nile, ewe tiye gi n'ọnọdu-ihere, mb͕e i nara umu-nne-gi ndinyom, bú umu-nne-gi ndinyom nke-okenye na umu-nne-gi ndinyom nke-ntà: M'gēwere kwa ha nye gi ibu umu-gi ndinyom, ma ọ bughi site n'ọb͕ub͕a-ndu-gi. 62 Mu onwem gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum nke Mu na i b͕ara guzosie ike; i we mara na Mu onwem bu Jehova: 63 ka i we cheta, ihere ewe me gi, i we ghara isaghe kwa ọnu-gi ọzọ ma-ọli, n'ihi ihere-gi; mb͕e M'gēkpuchiworo gi-ri ihe nile i meworo; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

Ezikiel 17

1 Okwu Jehova we ruem nti, si, 2 Nwa nke madu, tua otù ilu, tu-kwa-ra ulo Israel otù ilu; 3 si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ugo uku nke nkù-ya abua di uku, ábúbà-ya di kwa ogologo, nke juputara n'uruma, nke turu agwa, biaruru Lebanon, were ọnu-ọnu cedar: 4 ọnu nke alaka-ya nile wara ọhu ka ọ kubipuru, būru ba n'ala izu-ahia; n'obodo ndi-ahia ka o doro ya. 5 O we chiri ufọdu na nkpuru ala ahu, kua ya n'ubi di nma iku nkpuru; ọ kuru ya n'akuku ọtutu miri; dika osisi willow ka o tiyere ya. 6 O we pue, ghọ osisi vine nāwasa awasa nke di nkpunkpu, nke alaka-ya nile chere ya iru, nkpọrọgwu-ya nile di kwa n'okpuru ya: o we ghọ osisi vine, waputa ngalaba, wa alaka mara nma. 7 Ugo uku ọzọ di kwa, nke nkù-ya abua di uku, uruma-ya di kwa ọtutu: ma, le, osisi vine a rubere nkpọrọgwu-ya nile n'ebe ọ nọ, ọ bu kwa alaka-ya nile ka ọ wara n'ebe ọ nọ site na nkpuru nile nke ebe akuru ya, ka o we b͕a ya miri. 8 N'ubi ọma n'akuku ọtutu miri ka akuru ya, ka o we waputa ngalaba, mia nkpuru, ghọ osisi vine mara nma. 9 Si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ̀ gāgara ya nke-ọma? ọ̀ bughi nkpọrọgwu-ya nile ka ọ gēropu, bipu kwa nkpuru-ya, ka o we kpọnwua; ka akwukwọ ndu nile nke npute-ya we kpọnwua; ọ̀ gaghi-eji kwa ogwe-aka uku ma-ọbu ndi bara uba iropu ya site na nkpọrọgwu-ya nile? 10 Ma, le, ebe akuworo ya, ìhe gāgara ya nke-ọma? ọ̀ gaghi-akpọnwusi, mb͕e ifufe Iru-anyanwu nēfetu ya? nime nkpuru ebe o puru epu ka ọ gākpọnwu. 11 Okwu Jehova we ruem nti, si, 12 Biko, si ulo nnupu-isi ahu, Ùnu amaghi ihe ihe ndia bu? si, Le, eze Babilon biaruru Jerusalem, were eze-ya, na ndi-isi-ya, me ka ha biakute ya rue Babilon; 13 o we were otù onye sitere na nkpuru ala-eze ahu, ya na ya we b͕a ndu; o we me ka ọ ba n'ọb͕ub͕a-iyi, ọ bu kwa ndi nile di ike nke ala-ya ka ọ chiri: 14 ka ala-eze ahu we di ala, ghara ibuli onwe-ya elu, kama ka o we debe ọb͕ub͕a-ndu-ya we guzo. 15 O we nupu isi n'okpuru ya n'iziga ndi-ozi-ya n'Ijipt ka ha we nye ya inyinya na ndi bara uba. Ọ̀ gāgara ya nke-ọma? ọ̀ gēwepuga onwe-ya, bú onye nēme ihe ndia? ọ̀ gēmebi ọb͕ub͕a-ndu, we wepuga onwe-ya? 16 Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), n'ezie n'ebe eze ahu bi nke meworo ya eze, bú onye o ledara ọb͕ub͕a-iyi-ya, onye o mebi-kwa-ra ọb͕ub͕a-ndu-ya, n'ebe ọ nọ n'etiti Babilon ka ọ gānwu. 17 Fero agaghi-achiri kwa oké usu-ndi-agha-ya na nkpọkọta-madu-ya bara uba me ya ihe ọ bula n'agha ahu, mb͕e ha gāwukọta obo-ihe, wue ulo-agha, ibipu ọtutu madu. 18 Ebe o ledara ọb͕ub͕a-iyi n'imebi ọb͕ub͕a-ndu, ma, le, o nyereri aka-ya n'ikweye, ma ọ bu ihe ndia nile ka o mere; ọ gaghi-ewepuga onwe-ya. 19 N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Mu onwem nādi ndu, n'ezie ọb͕ub͕a-iyim nke o ledaworo, na ọb͕ub͕a-ndum nke o mebiworo, M'gātukwasi kwa ya n'isi-ya. 20 M'gāb͕asa ub͕um n'aru ya, agāma kwa ya n'ọnyàm, M'gēme kwa ka ọ biarue Babilon, Mu na ya gēkpe kwa ikpe n'ebe ahu bayere nmekpu-ya nke o mekpuru megidem. 21 Ma ndi-ya nile ndi b͕alagara ab͕alaga n'usu-ndi-agha-ya nile gāda site na mma-agha, ndi fọduru gāb͕asa-kwa-ra ifufe nile ọ bula: unu ewe mara na Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo. 22 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Mu onwem gēwere kwa ufọdu n'ọnu-ọnu osisi cedar di elu, kua ya; n'ọnu alaka-ya nke wara ọhu ka M'gākubipu alaka di nrò, Mu onwem gāku kwa ya n'elu ugwu di elu nke atuliri elu: 23 n'ugwu nke ebe di elu nke Israel ka M'gāku ya: ọ gāwaputa kwa ngalaba, mia nkpuru, ghọ osisi cedar mab͕uru onwe-ya: n'okpuru ya ka nnunu nile di iche iche gēbi; na ǹdò alaka-ya nile ka ha gēbi. 24 Osisi nile nke ọhia ewe mara na Mu onwem, bú Jehova, emewo ka osisi nke di elu di ala, emewom ka osisi nke di ala di elu, emewom ka osisi nke di ndu kpọnwua, emewom ka osisi nke kpọnwuru akpọnwu ma ifuru: Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo me kwa ya.

Ezikiel 18

1 Okwu Jehova we ruem nti, si, 2 Gini ka unu nēkwu, na unu onwe-unu nātu ilu a bayere ala Israel, si, Nna-ayi-hà eriwo nkpuru-vine nāchaghi acha, ezé umu-ha we nēru izìzì? 3 Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ay Jehova puta), n'ezie ọ gaghi-abu kwa ọlu-unu ọzọ itu ilu a n'Israel. 4 Le, nkpuru-obi nile, Mu nwe ha; dika nkpuru-obi nna si di, otú a ka nkpuru-obi nwa-ya di kwa, Mu nwe ha; nkpuru-obi ahu nke nēmehie, ya onwe-ya gānwu. 5 Ma onye ọ bula, mb͕e ọ bu onye ezi omume, nke nēme ihe ekpere n'ikpe na ezi omume, 6 asi na ọ bu onye nērighi ihe n'ugwu, nke nēwelighi anya-ya abua le arusi nile nke ulo Israel, nke nēmerughi nwunye madu-ibe-ya, nke nādighi-abia nso nwanyi di na nsọ; 7 nke nādighi-eme onye ọ bula ihe-ike, nke nēnyeghachi onye-ugwọ ihe-ibe-ya, nke nādighi-apunara madu ihe n'ike, nke nēnye onye-agu nri-ya, nke nēkpuchi onye-ọtọ uwe; 8 nke nādighēnye ego ka ọ nara uma, nke nādighi-anara ọmuru-nwa, nke nēsi n'ajọ omume seghachi aka-ya, nke nēme ihe ekpere n'ezi-okwu n'etiti madu na madu, 9 nke nējeghari n'ukpurum nile, nke debeworo ikpém nile, ime ihe n'ezi-okwu; onye ezi omume ka onye ahu bu, ọ ghaghi idi ndu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 10 Asi na ọ muwo nwa nke bu onye nke nēme ihe-ike, onye nāwusi ọbara, nke nēme otù ihe ọ bula n'ihe ndia, 11 ma ezi ihe ndia nile ka ọ nēmeghi, n'ihi na ọbuná n'ugwu ka o riworo ihe, ọ bu kwa nwunye madu-ibe-ya ka o meruworo, 12 onye ewedara n'ala na ob͕eye ka o meworo ihe-ike, ọ punarawo madu ihe n'ike, ọ dighi-enyeghachi ihe-ibe, ọ bu kwa arusi nile ka o weliworo anya-ya abua le, ihe-árú ka o meworo, 13 n'uma ka o nyeworo ego, ọ bu kwa ọmuru-nwa ka ọ naraworo: ọ̀ gādi kwa ndu? ọ gaghi-adi ndu: ihe-árú ndia nile ka o meworo: aghaghi ime ka ọ nwua; ọbara-ya gādi ya n'isi. 14 Ma, le, asi na ọ muwo nwa, o we hu nmehie nile nke nna-ya, nke o meworo, o we tua egwu, ghara ime ihe dika ihe ndia, 15 o righi ihe n'elu ugwu, o welighi anya-ya abua le arusi nile nke ulo Israel, o merughi nwunye madu-ibe-ya, 16 o meghi onye ọ bula ihe-ike, ọ naraghi ihe-ibe, ọ punaraghi madu ihe n'ike, nri-ya ka o nyeworo onye-agu, onye-ọtọ ka o kpuchiworo uwe, 17 o siwo n'aru onye ewedara n'ala seghachi aka-ya, uma na ọmuru-nwa ka ọ nānaraghi, ikpém nile ka o meworo, n'ukpurum nile ka o jeghariworo; onye ahu agaghi-anwu n'ihi ajọ omume nke nna-ya, ọ ghaghi idi ndu. 18 Ma nna-ya, n'ihi na ọ meb͕uru nke-uku, punara nwa-nne-ya ihe n'ike, me ihe nke nādighi nma n'etiti ndi-ya, le, ọ gānwu kwa n'ajọ omume-ya. 19 Ma unu asiwo, Gini mere nwa nējighi ebu ufọdu n'ajọ omume nna-ya? Mb͕e nwa ahu meworo ihe ekpere n'ikpe na ezi omume, debe ukpurum nile, me ha, ọ ghaghi idi ndu. 20 Nkpuru-obi ahu nke nēmehie, ya onwe-ya gānwu: nwa agaghi-ebu ufọdu n'ajọ omume nna-ya, nna agaghi-ebu kwa ufọdu n'ajọ omume nwa-ya; ezi omume nke onye ezi omume gādi n'isi ya, nmebi-iwu nke onye nēmebi iwu gādi kwa n'isi ya. 21 Ma onye nēmebi iwu, mb͕e ọ gēsi na nmehie-ya nile nke o meworo chigharia, debe ukpurum nile, me ihe ekpere n'ikpe na ezi omume, ọ ghaghi idi ndu, ọ gaghi-anwu. 22 Njehie-ya nile nke o meworo, agaghi-echeta ha megide ya: n'ezi omume-ya nke o meworo ka ọ gādi ndu. 23 Ọ̀ nātọm utọ ma-ọli, bú ọnwu nke onye nēmebi iwu? (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta): ọ̀ dighi-atọm utọ mb͕e o si n'uzọ-ya chigharia, we di ndu? 24 ma mb͕e onye ezi omume si n'ezi omume-ya chigharia, me ajọ omume, me dika ihe-árú nile si di nke onye nēmebi iwu meworo, ọ̀ gādi kwa ndu? Ezi omume-ya nile nke ọ meworo, agaghi-echeta ha: n'ihe-nmekpu-ya nke o mekpuworo, na nime nmehie-ya nke o mehieworo, nime ha ka ọ gānwu. 25 Ma unu asiwo, Adighi-atule uzọ Onye-nwe-ayi. Biko nurunu, ulo Israel: Ọ̀ bu uzọm ka anādighi-atule? ọ̀ bughi uzọ nile nke unu ka anādighi-atule? 26 Mb͕e onye ezi omume si n'ezi omume-ya chigharia, me ajọ omume, nwua n'ihi ha, n'ajọ omume-ya nke o meworo ka ọ gānwu. 27 Ma mb͕e onye nēmebi iwu si na nmebi-iwu-ya nke o meworo chigharia, me ihe ekpere n'ikpe na ezi omume, ya onwe-ya gēme ka nkpuru-obi-ya di ndu. 28 O we hu, si na njehie-ya nile o meworo; ọ ghaghi idi ndu, ọ gaghi-anwu. 29 Ma ulo Israel asiwo, Adighi-atule uzọ Onye-nwe-ayi. Ọ̀ bu uzọm ka anādighi-atule, ulo Israel? ọ̀ bughi uzọ nile nke unu ka anādighi-atule? 30 N'ihi nka ka M'gēkpe unu ikpe, unu ulo Israel, onye ọ bula ka uzọ-ya nile si di; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. Latanu, sinu na njehie nile unu chigharia; ajọ omume ewe ghara ighọrọ unu ihe-isu-ngọngọ. 31 Tupunu n'aru unu njehie nile unu nke unu jehieworo nime ha; mere onwe-unu obi ọhu na mọ ọhu: ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka unu gānwu, ulo Israel? 32 N'ihi na ọnwu nke onye nānwu anwu adighi-atọm utọ, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta): ya bu chigharianu, we di ndu.

Ezikiel 19

1 Ma gi onwe-gi, buliere ndi-isi Israel abù-ákwá, 2 si, Gini ka nne-gi bu? Ọ bu nne-ọdum: n'etiti ọdum ka ọ makpuru, n'etiti umu-ọdum ka o mere ka umu-ya ba uba. 3 O we zùputa otù n'umu-ya; nwa-ọdum ka ọ ghọrọ: o we muta idọb͕u anu-ndọb͕u, madu ka o riri. 4 Mba di iche iche we nu ihe bayere ya; n'olùlù-ha ka anwudere ya: ha ji nb͕a-aka-imi me ka ọ biarue ala Ijipt. 5 Nne-ọdum ahu we hu na o chereri, ma na olile-anya-ya alawo n'iyì, o we were otù ọzọ n'umu-ya, me ya nwa-ọdum. 6 Nwa-ọdum ahu we jegharia n'etiti ọdum, nwa-ọdum ka ọ ghọrọ: o we muta idọb͕u anu-ndọb͕u, madu ka o riri. 7 O we mata ulo ọma nile nke ala ahu, ọ bu kwa obodo nile ha ka o mere nkpọnkpọ ebe; ala ahu na ùjú-ya we tọb͕ọrọ n'efu, site n'olu nke nbib͕ọ-ya. 8 Mba nile we si n'ala nile anāchi achi megide ya buruburu: ha we b͕asa ub͕u-ha n'aru ya; n'olùlù-ha ka anwudere ya. 9 Ha we tiye ya n'ulo-nmechibido na nb͕a-aka-imi, me ka ọ biakute eze Babilon; ha nēme ka ọ ba n'ebe ewusiri ike, ka ewe ghara inu kwa olu-ya ọzọ n'ugwu nile nke Israel. 10 Nne-gi di ka osisi vine, n'ọbara-gi, n'akuku miri ka akuworo ya: osisi nke nāmi nkpuru nke juputa-kwa-ra na ngalaba ka ọ bu site n'ọtutu miri. 11 O we nwe nkpa-n'aka di ike ibu nkpa-n'aka-eze nke ndi nāchi achi, ogologo-ya we di elu rue n'etiti alaka b͕ara ọhia, ewe hu ya n'idi-elu-ya n'iba-uba nke alaka-ya nile. 12 Ewe ropu ya n'ọnuma, n'ala ka atudara ya, ifufe Iru-anyanwu we me ka nkpuru-ya kpọnwua: ab͕ajipuru nkpa-n'aka-ya nile di ike, ha we kpọnwua; ọku ripiara ha. 13 Ma ub͕u a akuwo ya n'ọzara, n'ala kpọrọ nku nke miri nādighi. 14 Ọku we si na nkpa-n'aka nke alaka-ya nile pua, nkpuru-ya ka o ripiaworo, nkpa-n'aka ọ bula nke di ike we ghara idi nime ya ibu nkpa-n'aka-eze ichi achi. Abù-ákwá ka nka bu, o we ghọ abù-ákwá.

Ezikiel 20

1 O rue n'arọ nke-asa, n'ọnwa nke-ise, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu, na ufọdu nime ndi-okenye Israel biara iju Jehova ase, ha we nọdu ala n'irum. 2 Okwu Jehova we ruem nti, si, 3 Nwa nke madu, gwa ndi-okenye Israel okwu, si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: ọ̀ bu ijum ase ka unu onwe-unu nābia? Mu onwem nādi ndu, M'gaghi-ekwe ka unu juam ase ma-ọli; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 4 Ì gēkpe ha ikpe, nwa nke madu, ì gēkpe ha ikpe? me ka ha mara ihe-árú nile nke ndi bu nna-ha; 5 si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ubọchi M'rọputara Israel, M'we weliere nkpuru ulo Jekob akam, me ka ha maram n'ala Ijipt, M'we weliere ha akam, si, Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu; 6 n'ubọchi ahu ka M'weliri akam nye ha, ime ka ha si n'ala Ijipt puta ba n'ala nke M'ledoro nye ha, nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya, nke bu ima-nma nke ala nile: 7 M'we si ha, Tufuenu, onye ọ bula ihe-árú nile nke anya-ya abua, unu eji-kwa-la arusi nile nke Ijipt merua onwe-unu; Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu. 8 Ha we nupu isi n'okpurum, ha ekweghi kwa igem nti; ha etufughi, onye ọ bula ihe-árú nile nke anya-ya abua, ha arapughi kwa arusi nile nke Ijipt: M'we si na M'gāwukwasi ha ọnumam, imezu iwem megide ha n'etiti ala Ijipt. 9 Ma alurum ọlu n'ihi aham, ka ewe ghara ime ya ka ọ ghara idi nsọ n'anya mba nile, ndi ha onwe-ha nọ n'etiti ha, ndi M'mere ka ha maram n'anya-ha, n'ime ka ha si n'ala Ijipt puta. 10 M'we me ka ha si n'ala Ijipt puta, M'we me ka ha ba n'ọzara. 11 M'we nye ha ukpurum nile, me ka ha mara ikpém nile, nke madu gādi kwa ndu nime ha, ma o me ha. 12 Ọzọ, ubọchi-izu-ikem nile ka M'nye-kwa-ra ha, ighọ ihe-iriba-ama n'etiti Mu na ha, ka ha we mara na Mu onwem bu Jehova, Nke nēdo ha nsọ. 13 Ulo Israel we nupu isi n'okpurum n'ọzara: ọ bughi n'ukpurum nile ka ha jeghariri, ikpém nile ka ha ju-kwa-ra, bú nke madu gādi kwa ndu nime ha, ma o me ha; ubọchi-izu-ikem nile ka ha mere ka ha ghara idi nsọ ma-ọli: M'we si na M'gāwukwasi ha ọnumam n'ọzara, ime ka ha gwusia. 14 M'we lua ọlu n'ihi aham, ka ewe ghara ime ka ọ ghara idi nsọ n'anya mba nile, ndi M'mere ka ha si n'ala Ijipt puta n'anya-ha. 15 Ọzọ kwa, Mu onwem weliri akam nye ha n'ọzara, si, na M'gaghi-eme ka ha ba n'ala ahu nke M'nyere ha, nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya, ima-nma ka ọ buru ala nile; 16 n'ihi na ikpém nile ka ha juru, ma ukpurum nile, ha ejegharighi nime ha, ubọchi-izu-ikem nile ka ha me-kwa-ra ka ha ghara idi nsọ: n'ihi na arusi nile ha ka obi-ha nējeso. 17 Anyam we mere ha ebere ka M'ghara ibibi ha, emeghkwam ka ha gwusia n'ọzara. 18 M'we si umu-ha n'ọzara, Unu ejegharila n'ukpuru nile nke nna-unu-hà, unu edebe-kwa-la ikpé nile ha, unu eji-kwa-la arusi nile ha meru onwe-unu: 19 Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu; jegharianu n'ukpurum nile, debe-kwa-nu ikpém nile, me ha: 20 donu ubọchi-izu-ikem nile nsọ; ha gāghọ kwa ihe-iriba-ama n'etiti Mu na unu, ka unu we mara na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu. 21 Umu-ha we nupu isi n'okpurum; ha ejeghi ije n'ukpurum nile, ha edebeghi kwa ikpém nile ime ha, bú nke madu gādi ndu nime ha, ma o me ha; ubọchi-izu-ikem nile ka ha mere ka ha ghara idi nsọ: M'we si na M'gāwukwasi ha ọnumam, imezu iwem megide ha n'ọzara. 22 Ma eseghachirim akam, we lua ọlu n'ihi aham, ka ewe ghara ime ka ọ ghara idi nsọ n'anya mba nile, ndi M'mere ka ha puta n'anya-ha. 23 Mu onwem weli-kwa-ra ha akam n'ọzara, si, na M'gāchusa ha n'etiti mba nile, fesa ha n'ala nile; 24 n'ihi na ha emeghi ihem nile ekpere n'ikpe, ọ bu kwa ukpurum nile ka ha juru, ubọchi-izu-ikem nile ka ha me-kwa-ra ka ha ghara idi nsọ, ọ bu kwa n'iso arusi nile nke ndi bu nna-ha ka anya-ha di. 25 Ọzọ, enye-kwa-ram ha ukpuru di iche iche nke nādighi nma, na ikpe di iche iche nke ha nāgaghi-adi ndu nime ha; 26 M'we merua ha n'onyinye nile ha, n'ime ka nwa ọ bula nke nēmeghe àkpà-nwa mbu gabiga n'ọku, ka M'we me ka ha tọb͕ọrọ n'efu, ka ha we mara na Mu onwem bu Jehova. 27 N'ihi nka, gwa ulo Israel okwu, gi nwa nke madu, si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ bu kwa na nka ka nna-unu-hà kwulurum, n'imekpu emekpu megidem. 28 N'ihi na mb͕e M'mere ka ha ba n'ala ahu, nke M'weliri akam elu inye ha, ha we hu ugwu ntà nile ọ bula di elu, na osisi nile ọ bula b͕ara ọhia, ha we chua àjà nile ha n'ebe ahu, nye nkpasu-iwe nke onyinye-ibiaru-nso-ha n'ebe ahu, do ihe-ísì-utọ nile ha n'ebe ahu, wusi àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha n'ebe ahu. 29 M'we si ha, Gini bu ebe a di elu ebe unu onwe-unu nābà? Ewe kpọ aha-ya Bama rue ta. 30 N'ihi nka si ulo Israel, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ̀ bu n'uzọ nke nna-unu-hà ka unu onwe-unu nēmeru onwe-unu? ọ̀ bu kwa ihe-árú nile ha ka unu nākwaso iko? 31 ọzọ, mb͕e unu nēbuli onyinye nile unu, mb͕e unu nēme ka umu-unu gabiga n'ọku, ọ̀ bu na unu onwe-unu nēmeru onwe-unu n'arusi nile unu, rue ta? ma Mu onwem, #M'gēkwe ka unu juam ase, ulo Israel? Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), M'gaghi-ekwe ka unu juam ase ma-ọli: 32 ma ihe ahu nke nābà nime mọ-unu, ọ gaghi-adi ma-ọli; ọ bu na unu onwe-unu nāsi, Ayi gādi ka mba nile, dika ab͕uru nile nke ala nile, ijere osisi na nkume ozi. 33 Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), n'ezie ọ bu aka di ike, ọ bu kwa ogwe-aka esetiri eseti, ọ bu kwa ọnuma awusiri awusi, ka M'gēji buru eze-unu: 34 M'gēji kwa aka di ike, ji kwa ogwe-aka esetiri eseti, ji kwa ọnuma awusiri awusi, me ka unu si na ndi nile di iche iche puta, chikọputa kwa unu n'ala nile ebe unu b͕asaworo: 35 M'gēme kwa ka unu bata n'ọzara nke ndi nile di iche iche, Mu na unu gēkpe kwa ikpe n'ebe ahu iru na iru. 36 Dika Mu na nna-unu-hà kpere ikpe n'ọzara nke ala Ijipt, otú a ka Mu na unu gēkpe ikpe; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 37 M'gēme kwa ka unu gabiga n'okpuru nkpa-n'aka, M'gēme kwa ka unu ba n'ihe-nkegide nke ọb͕ub͕a-ndum; 38 M'gāsachapu kwa ndi nānupu isi na ndi nējehie megidem n'etiti unu; n'ala ebe ha nọ dika ọbìa ka M'gēme ka ha si puta, ma ọ bughi n'ala Israel ka ha gābà: unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova. 39 Ma unu onwe-unu, ulo Israel, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Jenu, fè, onye ọ bula arusi-ya nile, ma emesia unu aghaghi igem nti: ma unu agaghi-eji onyinye nile unu na arusi nile unu me ka aha nsọm ghara idi nsọ ọzọ. 40 N'ihi na n'ugwu nsọm, n'ugwu nke ebe di elu nke Israel, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), n'ebe ahu ka ulo Israel nile, ka ọ ra, gēfèm n'ala-ha: n'ebe ahu ka ihe-ha gātọm utọ, ọ bu kwa n'ebe ahu ka M'gāchọ àjà-nbuli nile unu na nkpuru mbu nke ùtú nile unu, ha na ihe nsọ nile unu. 41 N'ísì utọ ka ihe-unu gātọm utọ, mb͕e M'mere ka unu si na ndi nile di iche iche puta, mb͕e M'chikọputara unu n'ala nile nke unu b͕asaworo nime ha; agēdokwam nsọ nime unu n'anya mba nile. 42 Unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'gēme ka unu ba n'ala Israel, n'ala ahu nke M'weliri akam elu iwere ya nye nna-unu-hà. 43 Unu gēcheta kwa n'ebe ahu uzọ nile unu, na omume nile unu, nke unu meruru onwe-unu nime ha; unu gāsọ kwa onwe-unu oyi n'iru unu n'ihi ihe ọjọ nile unu nke unu meworo. 44 Unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'mesoworo unu n'ihi aham, ọ bughi dika uzọ ọjọ nile unu si di, ọ bughi kwa dika omume nile unu nke bibiri ebibi, unu ulo Israel; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 45 Okwu Jehova we ruem nti, si, 46 Nwa nke madu, che iru-gi n'uzọ Ndida, me ka okwu-gi busa dika miri-ozuzo n'ebe Ndida di, bue amuma megide oké ọhia nke ọhia ahu di na Negeb; 47 si oké ọhia Negeb, Nuru okwu Jehova; Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, M'gaje isuye ọku nime gi, ọ gēripia kwa osisi ndu nile ọ bula na osisi nile ọ bula kpọrọ nku nke di nime gi: ire-ọku-ya nēnwu enwu, ọ gaghi-anyu anyu, ọ gāru kwa iru nile site na Negeb rue na Ugwu. 48 Anu-aru nile, bú madu, gāhu kwa na Mu onwem, bú Jehova, esuyewo ya: ọ gaghi-anyu anyu. 49 M'we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! ha nēkwu okwu bayerem, si, Ọ̀ bughi onye nātu ilu ilu ka ọ bu?

Ezikiel 21

1 Okwu Jehova we ruem nti, si, 2 Nwa nke madu, che iru-gi na Jerusalem, busa okwu-gi dika miri-ozuzo n'ebe ebe nsọ ya nile di, bu kwa amuma megide ala Israel; 3 si ala Israel, Otú a ka Jehova siri: Le, Mu nēmegide gi, M'gāmiputa kwa mma-agham n'ọbọ-ya, bipu nime gi onye ezi omume na onye nēmebi iwu. 4 Ebe M'gēbipu nime gi onye ezi omume na onye nēmebi iwu, n'ihi nka ka mma-agham gēsi n'ọbọ-ya puta imegide anu-aru nile, bú madu, site na Ndida rue Ugwu: 5 anu-aru nile, bú madu, ewe mara na Mu onwem, bú Jehova, amiputawo mma-agham n'ọbọ-ya; ọ gaghi-alaghachi kwa ọzọ. 6 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, ze ume; na nb͕aji úkwù na n'ilu obi ka i gēze ume n'anya-ha. 7 Ma ọ gēru, mb͕e ha gāsi gi, N'ìhi gini ka gi onwe-gi nēze ume? na i gāsi, Ọ bu n'ihi akukọ, n'ihi na ọ nābia: obi nile ọ bula gālọ kwa miri, aka nile gākuda, ike gāgwu mọ madu nile ọ bula, ikperè-ukwu nile gāghọ miri miri: le, ọ nābia, o ruwo kwa, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 8 Okwu Jehova we ruem nti, si, 9 Nwa nke madu, bue amuma, si, Otú a ka Jehova siri: Si, Le, mma-agha, le, mma-agha, amuru ya amu, ọ bu kwa ihe emere ka ọ nēb͕u maramara: 10 amuru ya amu ka o we b͕ue madu nke-uku; emere ya ka ọ nēb͕u maramara ka o we di ka àmùmà: òbi gatọ kwa ayi utọ? nkpa-n'aka nwam, ọ nāju osisi nile ọ bula. 11 Ewe were ya nye ka eme ya ka ọ nēb͕u maramara, ka ewe jide ya n'ọbu-aka: amuru nke ahu amu, bú mma-agha, eme-kwa-ra nke ahu ka ọ nēb͕u maramara, ka ewe nye ya n'aka onye nēb͕u eb͕u. 12 Tie nkpu, kwasie ákwá ike, nwa nke madu: n'ihi na nke ahu di n'aru ndim, nke ahu di n'aru ndi-isi Israel: ndi arara nye mma-agha ka ha na ndim bu: n'ihi nka tie aka n'apata-ukwu-gi. 13 N'ihi na ọnwunwa di; gini gēme kwa ma ọ buru na ọbuná nkpa-n'aka nke nāju aju ghara idi? ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 14 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, bue amuma, kukọta ọbu-aka-gi abua; ka mma-agha di okpukpu atọ, bú mma-agha nke ndi anēb͕u eb͕u: nke ahu bu mma-agha nke onye uku ahu nke anēb͕u eb͕u, nke nāb͕achibido ha buruburu. 15 Ọ bu n'akuku ọnu-uzọ-ama nile ha ka M'tiyeworo ọnu-ọnu mma-agha, ka obi we lọ ha miri, ka ewe me kwa ka ihe-isu-ngọngọ ba uba: ewó! emewo ya ka ọ ghọ àmùmà, amuru ya amu ib͕u eb͕u. 16 Me onwe-gi ka i di otù, ga n'aka-nri; do onwe-gi n'usoro, ga n'akpa-ekpe; ebe ọ bula akaworo iru-gi àkà iga. 17 Ọzọ, Mu onwem gākukọta kwa ọbu-akam abua, M'gēme kwa ka ọnumam zuru ike: Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo. 18 Okwu Jehova we ruem nti, si, 19 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, mere onwe-gi uzọ abua, ka mma-agha nke eze Babilon we bia; n'otù ala ka ha abua gēsi puta: gi ka kwa akàrà yiri aka madu, ka ya n'isi uzọ obodo. 20 Uzọ ka i gēme, ka mma-agha we biarue Raba nke umu Amon, ru kwa Juda nime Jerusalem, bú ebe ewusiri ike. 21 N'ihi na eze Babilon guzoro n'ab͕ata uzọ, n'isi uzọ abua ahu, iju ase: o feghariri àkú-ya nile, jua ase n'aka terafim-ya, lekwasi imeju anya. 22 N'aka-nri-ya ka ihe iji ju ase bayere Jerusalem di, ido ihe di iche iche eji etipú mb͕idi, isaghe ọnu n'ob͕ub͕u, iweli olu n'iti nkpu agha, ido ihe di iche iche eji etipú mb͕idi imegide ọnu-uzọ-ama nile, iwukọta obo-ihe, iwu ulo-agha. 23 Ọ gādi-kwa-ra ha ka ọjuju-ase efu n'anya-ha, bú ndi ṅuworo ha iyi di iche iche: ma ya onwe-ya nēme ka echeta ajọ omume, ka ewe jide ha. 24 N'ihi nka otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na unu emewo ka echeta ajọ omume unu, nime nkpughe njehie nile unu, ewe hu nmehie nile unu n'omume nile unu; n'ihi na emewo ka echeta unu, ọ bu n'ọbu-aka ka agējide unu. 25 Ma gi onwe-gi, onye emeruworo aru, onye nēmebi iwu, bú onye-isi Israel, onye ubọchi-ya biaworo, na mb͕e ajọ omume nke mb͕e ikpe-azu; 26 otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Wezuga ákwà-nkukù-isi ahu, bupu okpu-eze ahu: nka agaghi-abu kwa ihe ọ bu: me ihe nke di ala ka ọ di elu, me kwa ihe nke di elu ka ọ di ala. 27 Nkpù-iru, nkpù-iru, nkpù-iru ka M'gēkpù-ya: nka kwa, ọ gaghi-adi rue mb͕e ọ gābia, bú onye o ruru aka; M'gēwere kwa ya nye ya. 28 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, bue amuma, si, Okwu di otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova kwuru bayere umu Amon, baye-kwa-ra ita-uta-ha, si; gi si kwa, Le, mma-agha, bú mma-agha nke amiputaworo, n'ihi ob͕ub͕u ka emere ya ka ọ nēb͕u maramara, otú ọ gēkwe ya inagide, ka o we di ka àmùmà: 29 mb͕e ha nāhuru gi ọhù efu, mb͕e ha nājuru gi ase okwu-ugha, itiye gi n'olu ndi nēmebi iwu ndi eb͕uru eb͕u, ndi ubọchi-ha abiawo, na mb͕e nke ajọ omume nke mb͕e ikpe-azu. 30 Mighachi ya n'ọbọ́-ya. N'ebe ekère gi, n'ala nputa-uwa-gi, ka M'gēkpe gi ikpe. 31 M'gāwukwasi gi ajọ iwem; ọku nke nrubiga-ókè nke iwem ka M'gēji fùkwasi gi: M'gēnye kwa gi n'aka ndikom bu nání anu-ọhia, ndi di ǹkà n'ibibi ebibi. 32 I gāghọrọ ọku nri; ọbara-gi gādi n'etiti ala-gi; agaghi-echeta gi: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo.

Ezikiel 22

1 Okwu Jehova we ruem nti, si, 2 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, ì gēkpe ikpe, ì gēkpe obodo ọbara nka ikpe? i gēme kwa ka ọ mara ihe-árú nile ya. 3 I gāsi kwa, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le obodo nke nāwusi ọbara n'etiti ya, ka mb͕e-ya we bia, nke nēme kwa arusi di iche iche megide onwe-ya imeru onwe-ya! 4 N'ọbara-gi, bú nke i wusiworo, ka ikpe maworo gi, ọ bu kwa n'arusi-gi nile, bú nke i meworo, ka i ruru árú; i we me ubọchi-gi ka ha biarue nso, i we biarue ọgwugwu arọ-gi nile: n'ihi nka ka M'meworo gi ka i ghọrọ mba nile ihe-ita-uta, ka i ghọ-kwa-ra ala nile ihe-ọchì. 5 Ndi di nso na ndi di anya n'ebe i nọ gāchì gi ọchì, gi obodo nke aha-gi ruru árú, nke juputara n'ọb͕ub͕a-aghara. 6 Le, ndi-isi Israel, onye ọ bula ka ogwe-aka-ya ra, anọwo nime gi iwusi ọbara. 7 Nna na nne ka ha lelìworo nime gi; ọbìa ka ha jiworo nmeb͕u emeso n'etiti gi: nwa-nb͕ei na nwanyi di-ya nwuru ka ha meworo ihe-ike nime gi. 8 Ihe nsọm nile ka i ledaworo anya, ọ bu kwa ubọchi-izu-ikem nile ka i meworo ka ha ghara idi nsọ. 9 Ndi nāb͕a àmà ọjọ anọwo nime gi iwusi ọbara: ọ bu kwa n'ugwu nile ka ha riworo ihe nime gi: ajọ ihe-nzube ka ha meworo n'etiti gi. 10 Ọtọ nna ka ekpugheworo nime gi: nwanyi nke ruru árú n'idi-na-nsọ-ya ka ha wedaworo n'ala nime gi. 11 Ọzọ, otù nwoke esorowo nwunye nke madu-ibe-ya me ihe-árú; nwoke ọzọ emeruwo nwunye nwa-ya n'ajọ ihe-nzube; nwoke ọzọ ewedawo nwa-nne-ya nwayi, bú nwa nke nna-ya, n'ala nime gi. 12 Ngo ka ha riworo nime gi iwusi ọbara; uma na ọmuru-nwa ka i naraworo, i we were nmeb͕u rita urù nēzighi ezi n'aka madu-ibe-gi nile, ma Mu onwem ka i chezọworọ, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 13 Ma, le, akuwom ọbu-akam n'ebe urù-gi nēzighi ezi nke i ritaworo di, na n'ihi ọbara-gi nke diworo n'etiti gi. 14 Obi-gi, ò gēguzo? ma-ọbu aka-gi abua, hà gādi ike n'ubọchi ndia mb͕e Mu onwem nēmeso gi? Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo, me kwa ya. 15 M'gāchusa kwa gi n'etiti mba nile, fesa kwa gi n'ala nile; M'gēme kwa ka iru-árú-gi si nime gi gwusia. 16 Agēme kwa ka i ghara idi nsọ n'onwe-gi, n'anya mba nile; i we mara na Mu onwem bu Jehova. 17 Okwu Jehova we ruem nti, si, 18 Nwa nke madu, ulo Israel aghọworom afuru-uzu: ha nile bu ọla na b͕amb͕am na ígwè na opù, n'etiti oké ọku; afuru-uzu nke ọla-ọcha ka ha ghọworo. 19 N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: N'ihi na unu nile aghọwo afuru-uzu, n'ihi nka, le, M'gaje ichikọta unu n'etiti Jerusalem. 20 Dika esi achikọta ọla-ọcha na ọla na ígwè na opù na b͕amb͕am n'etiti oké ọku, ifunwu ya ọku, ib͕aze ya; otú a ka M'gāchikọta unu n'iwem na n'ọnumam, tọb͕ọ unu n'ebe ahu, b͕aze unu. 21 E, M'gākpọkọta unu, were ọku nke nrubiga-ókè nke iwem fukwasi unu, unu ewe b͕aze n'etiti ya. 22 Dika esi ab͕aze ọla-ọcha n'etiti oké ọku, otú a ka agāb͕aze unu n'etiti ya; unu ewe mara na Mu onwem, bú Jehova, awukwasiwo unu ọnumam. 23 Okwu Jehova we ruem nti, si, 24 Nwa nke madu, si ya, Gi onwe-gi bu ala nke anēmeghi ka ọ di ọcha, miri ezokwasighi ya n'ubọchi ajọ iwe. 25 Nkekọta ọjọ nke ndi-amuma-ya di n'etiti ya, dika ọdum nāb͕ọ uja nke nādọb͕u anu-ndọb͕u: nkpuru-obi madu ka ha ripiaworo; àkù na ihe di oké ọnu-ahia ka ha nēwere; ha emewo ka ndinyom-ya di-ha nwuru ba uba n'etiti ya. 26 Ndi-nchu-àjà-ya emewo iwum ihe-ike, me ka ihe nsọm nile ghara idi nsọ: ọ dighi ókè ha kpaworo n'etiti ihe nsọ na ihe nādighi nsọ, ha emeghi kwa ka madu mara ihe di iche n'etiti ihe ruru árú na ihe di ọcha, ọ bu kwa ubọchi-izu-ikem nile ka ha zonariworo anya-ha, ewe me ka M'ghara idi nsọ n'etiti ha. 27 Ndi-isi-ya n'etiti ya di ka anu-ọhia ọdum nādọb͕u anu-ndọb͕u; iwusi ọbara, ime ka nkpuru-obi madu la n'iyì, ka ha we rita urù nēzighi ezi. 28 Ọzọ, ndi-amuma-ya eteworo ha nzu, nāhu ọhù efu, nāju-kwa-ra ha ase okwu-ugha, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri, ma Jehova ekwughi okwu. 29 Ndi ala nka emeb͕uwo emeb͕u, punara madu ihe n'ike; onye ewedara n'ala na ob͕eye ka ha meworo ihe-ike, ọ bu kwa ọbìa ka ha meb͕uworo n'ekpeghi ikpe. 30 M'we chọ otù onye n'etiti ha, onye gaje ib͕a ogige, guzo kwa na ntipú n'irum n'ihi ala-ya, ka M'we ghara ibibi ya: ma achọtaghm. 31 M'we wukwasi ha ajọ iwem dika miri; ọku nke nrubiga-ókè nke iwem ka M'jiworo me ka ha gwusia: uzọ-ha ka M'tiyekwasiworo n'isi-ha; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

Ezikiel 23

1 Okwu Jehova we ruem nti, si, 2 Nwa nke madu, ndinyom abua diri, bú umu otù nne: 3 ha we kwa iko n'Ijipt; ọ bu mb͕e ha di na nwata ka ha kwara iko: n'ebe ahu ka abiagidere ara-ha, ọ bu kwa n'ebe ahu ka ha piri ọnu-ọnu ara-ha aka, bú nke ha nwere mb͕e ha di nāmaghi nwoke. 4 Ma aha-ha bu Ohola, ya bu nke-okenye, na Oholiba, bú nwa-nne-ya: ha we ghọ ndi nkem, mua umu-ndikom na umu-ndinyom. Ma aha-ha, Sameria bu Ohola, Jerusalem bu Oholiba. 5 Ohola we kwa iko mb͕e ọ nọ n'okpurum; agu ndi nāhu ya n'anya we gua ya, bú ndi Asiria ndi bu ab͕ata-obi-ya, 6 ndi yiri uwe anunu, ha bu ndi nāchi ala na ndi nọchiri anya eze, umu-okorọbia anāchọsi ike ka ha nile bu, ha bu ndi-inyinya nānọkwasi inyinya. 7 O we kwaso ha iko nke-uku, ndi arọputara arọputa nke umu Asiria ka ha nile bu: ma onye ọ bula nke agu ya guru ya, arusi nile ha ka o ji merua onwe-ya. 8 Ma ikwa-iko-ya nile nke sitere n'Ijipt ka ọ nārapughi; n'ihi na ya na ha dinara mb͕e ọ di na nwata, ndi ahu pi-kwa-ra ọnu-ọnu ara-ya abua aka, bú nke o nwere mb͕e ọ di nāmaghi nwoke: ha we wukwasi ya ikwa-iko-ha dika miri. 9 N'ihi nka ka M'nyere ya n'aka ndi nāhu ya n'anya, n'aka umu Asiria, ndi agu ha guru ya. 10 Ndi ahu kpughere ọtọ-ya: umu-ya ndikom na umu-ya ndinyom ka ha chiri, ma ya onwe-ya ka ha jiri mma-agha b͕ue: o we ghọrọ ndinyom aha iji dọ ha aka na nti; ọ bu kwa ihe nile ekpere n'ikpe ka ha mere n'aru ya. 11 Nwa-nne-ya nwanyi, bú Oholiba, we hu nka, ma o bibiri onwe-ya kari nwa-nne-ya n'agu ndikom nke guru ya, na n'ikwa-iko-ya nile nke kariri ikwa-iko nile nke nwa-nne-ya. 12 Agu umu Asiria guru ya, bú ndi nāchi ala na ndi nọchiri anya eze, ndi bu ab͕ata-obi-ya, ndi yiri uwe mab͕uru onwe-ya, ha bu ndi-inyinya nānọkwasi inyinya, umu-okọrọbia anāchọsi ike ka ha nile bu. 13 M'we hu na ọ ruru árú; otù uzọ ka ha abua siri. 14 O we tukwasi ihe n'ikwa-iko-ya; o we hu ndikom akàrari na mb͕idi, bú onyinyo ndi Kaldea eji ihe-otite nācha uhie uhie kà, 15 ndi ekereri ihe-ọkiké n'úkwù-ha, ndi ejiri ákwà esijiri esiji kebiga isi-ha ókè, n'ile ha anya ndi-isi-agha ka ha nile bu, dika oyiyi umu Babilon nke Kaldea, bú ala amuru ha. 16 Agu ha we gua ya mb͕e ọ nēle ha anya, o we zigara ha ndi-ozi rue Kaldea. 17 Umu Babilon we biakute ya n'ihe-ndina nke ikwa-iko, ha we merua ya n'ikwa-iko nile ha, o we rua árú site na ha, nkpuru-obi-ya we kewapu n'ebe ha nọ. 18 O we kpughe ikwa-iko-ya nile, kpughe kwa ọtọ-ya: nkpuru-obim we kewapu n'aru ya, dika nkpuru-obim si ekewapu n'aru nwa-nne-ya. 19 O we me ka ikwa-iko-ya nile ba uba, n'icheta ubọchi nile ọ di na nwata, mb͕e ọ kwara iko n'ala Ijipt. 20 Agu ndikom-ha nākwa iko we gua ya, ndi anu-aru-ha bu anu-aru inyinya-ibu, uré-ha bu kwa uré inyinya. 21 I we leta ajọ ihe-nzube nke mb͕e i di na nwata, n'ipi ọnu-ọnu ara-gi abua nke ndi Ijipt piri n'ihi ara abua nke i nwere mb͕e i di na nwata. 22 N'ihi nka, Oholiba, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, M'gaje ikpọte ndi nāhu gi n'anya imegide gi, bú ndi nkpuru-obi-gi kewapuworo n'ebe ha nọ, M'gēme kwa ka ha si n'ebe nile di buruburu biakwasi gi; 23 bú umu Babilon na Kaldea nile, na Pekod na Shoa na Koa, ha na umu Asiria nile: bú umu-okorọbia anāchọsi ike, ndi nāchi ala na ndi nọchiri anya eze ka ha nile bu, ha bu ndi-isi-agha na ndi akpọrọ akpọ, ndi nānọkwasi n'inyinya ka ha nile bu. 24 Ha gābiakwasi kwa gi chiri ihe-agha, na ub͕ọ-ala, na wheel nākpọre akpọre, chiri kwa nkpọkọta nke ndi di iche iche; ọta uku na ọta na okpu-agha ka ha gēji do onwe-ha imegide gi buruburu: M'gēnye kwa ha ikpé n'aka, ha gēkpe kwa gi n'ikpe nile ha. 25 M'gēdo kwa ekworom imegide gi, ha gēmeso kwa gi n'ọnuma; imi-gi na nti-gi abua ka ha gēwezuga; ọzọ, ndi gēsota gi n'azu gāda site na mma-agha: umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom ka ha gāchiri; ọku gēripia kwa ndi gēsota gi n'azu. 26 Ha gēyipu kwa uwe-gi nile n'aru-gi, chiri ihe-gi nile mara nma. 27 M'gēme kwa ka ajọ ihe-nzube-gi kwusi n'aru gi, ya na ikwa-iko-gi nile sitere n'ala Ijipt: i gaghi-eweli kwa anya-gi abua le ha, i gaghi-echeta kwa Ijipt ọzọ. 28 N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, M'gaje inye gi n'aka ndi i nākpọ asì, n'aka ndi nkpuru-obi-gi kewapuworo n'ebe ha nọ: 29 ha gēmeso kwa gi n'ikpọ-asì, wepu ihe nile i dọtara n'idọb͕u onwe-gi n'ọlu, ha gārapu kwa gi i b͕arasia ọtọ: agēkpughe kwa ọtọ nke ikwa-iko-gi nile, ma ajọ ihe-nzube-gi ma ikwa-iko-gi nile. 30 Agēme gi ihe ndia, n'ihi na i kwasoro mba di iche iche iko, n'ihi na i jiwo arusi nile ha rua árú. 31 N'uzọ nwa-nne-gi nwanyi ka i jeworo ije; M'gēwere kwa ìko-ya nye gi ṅ'aka. 32 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Iko nwa-nne-gi nwanyi ka i gāṅu, bú iko nke miri emi nke sa-kwa-ra mbara: i gāghọ onye anāchì ọchì na onye anākwa emò: ọ nānagide ihe ri nne. 33 N'iṅubiga-manya-ókè na ihe-nb͕u ka i gējuputa, n'iko ihe-iju-anya na itọb͕ọrọ-n'efu, n'iko nwa-nne-gi nwanyi, bú Sameria. 34 I gāṅu kwa ya, ṅusia ya, ọbuná ejùjù-ya nile ka i gāracha, ara-gi abua ka i gādọwapu: n'ihi na Mu onwem ekwuwo okwu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 35 N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: N'ihi na i chezọwom, tufuem n'azu-gi, n'ihi nka gi onwe-gi būru kwa ajọ ihe-nzube-gi na ikwa-iko-gi nile. 36 Jehova we sim: Nwa nke madu, i gēkpe Ohola na Oholiba ikpe? gosi kwa ha ihe-árú nile ha. 37 N'ihi na ha akwawo iko, ọbara di kwa n'aka-ha, ọ bu kwa arusi nile ha ka ha kwasoworo iko; ọzọ kwa, umu-ha ndikom, bú ndi ha mutaram, ka ha mere ka ha gabigara ha ọku, ka o we ripia ha. 38 Ọzọ kwa, nka ka ha meworom: ha emeruwo ebe nsọm n'ubọchi ahu, me ka ubọchi-izu-ikem nile ghara idi nsọ. 39 N'ihi na mb͕e ha b͕uru umu-ha ndikom nye arusi nile ha, ha we bata n'ebe nsọm ubọchi ahu ime ka ọ ghara idi nsọ; ma, le, otú a ka ha meworo n'etiti ulom. 40 Ọzọ kwa, unu nēziga ikpọ ndikom ndi nēsi n'ebe di anya bia: bú ndi ezigaworo onye-ozi, ma, le, ha biara; ndi i sara aru n'ihi ha, de ihe n'anya-gi abua, chiri ihe-ichọ-nma chọ onwe-gi nma, 41 nọkwasi n'ihe-ndina di nsọpuru, nke table edoro n'usoro di kwa n'iru ya, ọ bu kwa ihe-nsure-ọkum nke nēsì ísì utọ na manum ka i dọbara n'elu ya. 42 Olu ìgwè madu ndi nọ n'udo di kwa nime ya: tukwasi kwa ndikom ndi sitere n'ọra madu, emewo ka ndi nāṅubiga manya ókè si n'ọzara bia; ha we tiye ọla-aka n'aka nke ndinyom ahu, na okpu-eze mara nma n'isi-ha. 43 M'we kwue okwu bayere nwanyi ahu kara nká n'ikwa-iko-ya nile, si, Ub͕u a ka ha gākwa iko nile ọ nākwa, ya onwe-ya gākwa kwa iko. 44 Ha we bakuru ya, dika madu si abakuru nwanyi nākwa iko: otú a ka ha bakuru Ohola, bakuru kwa Oholiba, bú ndinyom ahu nēzube ajọ ihe. 45 Ma ndi ezi omume, ha onwe-ha gēkpe ha ikpe nke ndinyom nākwa iko na ikpé nke ndinyom nāwusi ọbara; n'ihi na ndinyom nākwa iko ka ha bu, ọbara di kwa n'aka-ha. 46 N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: M'gēme ka nkpọkọta madu rigota imegide ha, M'gēwere kwa ha nye ka ha ghọ ihe-ntughari na ihe-nluta-n'agha. 47 Nkpọkọta madu ahu gēwere kwa nkume tub͕ue ha, were mma-agha-ha b͕ue ha; umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom ka ha gēb͕u, ulo nile ha ka ha gēsure n'ọku. 48 M'gēme kwa ka ajọ nzube kwusi n'ala-unu, ka ewe dọ ndinyom nile aka na nti, ha ewe ghara ime dika ajọ nzube-unu si di. 49 Ha gētiyekwasi kwa unu ajọ nzube-unu, ọ bu kwa nmehie nile nke arusi nile unu ka unu gēbu: unu ewe mara na Mu onwem bu Onye-nwe-unu Jehova.

Ezikiel 24

1 Okwu Jehova we ruem nti n'arọ nke-iteghete, n'ọnwa nke-iri, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu, si, 2 Nwa nke madu, dere onwe-gi aha nke ubọchi a, bú ubọchi nke ta: eze Babilon kwagidere Jerusalem n'ubọchi nke ta. 3 Tu-kwa-ra ulo nnupu-isi ahu ilu, si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri, Sikwasi ite ahu, sikwasi ya, ọzọ kwa, b͕aye ya miri: 4 chikọta anu-ya abọrọ abọ nime ya, bú ọbubọ ọ bula di nma, utaku-ukwu, na ọlu-aka; kpojue ya n'ọkpukpu arọputara arọputa. 5 Were aturu arọputara arọputa n'ìgwè ewu na aturu, tukọba kwa ọkpukpu n'okpuru ya: me ya ka ọ b͕ọ nke-ọma; ka esi kwa ọkpukpu-ya nile n'etiti ya. 6 N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Ahuhu diri obodo ọbara ahu, bú ite nke nchara-ya di nime ya, nke nchara-ya nāpughi nime ya! weputa ya n'ọbubọ n'ọbubọ; nzà amaghi ya. 7 N'ihi na ọbara-ya adiwo n'etiti ya; n'elu nkume di elu nke ọhia nādighi ya ka ọ debere ya; ọ wusighi ya n'ala, ikpuchi ya ájá; 8 ka o we me ka ọnuma rigota ibọ̀ ọ́bọ̀, ya ka M'ji tiye ọbara-ya n'elu nkume di elu nke ọhia nādighi ya, ka ewe ghara ikpuchi ya. 9 N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Ahuhu diri obodo ọbara ahu! Mu onwem gēme kwa ka obo-ya di uku. 10 Me ka nkú ba uba, muye ọku, sizue anu ahu, me ka ofé-ya lọ alọ, ka esure kwa ọkpukpu-ya nile. 11 Guzo kwa ite ahu n'elu icheku-ọku-ya nēre ere mb͕e ihe nādighi ya, ka o we di ọku, ọla-ya ewe re ọku, iru-árú-ya ab͕aze kwa n'etiti ya, ka nchara-ya we gwusia. 12 O jiwo ndọbu nile ọ nādọbu onwe-ya n'ọlu me ka ike gwu ya: ma nchara-ya nke riri nne esighi nime ya pua; n'ọku ka nchara-ya di. 13 N'iru-árú-gi ka ajọ nzube di: n'ihi na emewom ka i di ọcha ma i dighi ọcha, i gaghi-esi kwa n'iru-árú-gi di ọcha ọzọ, rue mb͕e M'gēmewori ka ọnumam zuru ike n'aru gi. 14 Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu: ọ gābia, M'gēme kwa ya; M'gaghi-arapu, M'gaghi-eme kwa ebere, M'gaghi-echèghari; dika uzọ-gi nile si di, na dika omume-gi nile si di, otú a ka ha gēkpe gi ikpe; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 15 Okwu Jehova we ruem nti, si, 16 Nwa nke madu, le, M'gaje iwere ihe-otiti napu gi onye ahu nke anya-gi nāchọsi ike: ma i gaghi-eti aka n'obi, i gaghi-akwa kwa ákwá, anya-miri agaghi-ab͕a kwa gi. 17 Ze ume, debe ọnu-gi du; i gaghi-emere ndi nwuru anwu oruru-újú, ke ihe-ike-n'isi-gi n'onwe-gi, akpukpọ-ukwu-gi ka i gētiye kwa n'ukwu-gi abua, i gaghi-ekpuchi kwa eb͕ub͕ere-ọnu-elu-gi, i gaghi-eri kwa nri ndi ọzọ. 18 M'we gwa ndi Israel okwu n'ututu; nwunyem we nwua n'anyasi: m'we me n'ututu dika ihe ahu si di enyerem n'iwu. 19 Ndi Israel we sim, Ì gaghi-egosi ayi ihe ihe ndia bu n'ebe ayi nọ, na gi onwe-gi nēme otú a? 20 M'we si ha, Okwu Jehova rurum nti, si, 21 Si ulo Israel, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, M'gaje ime ka ebe nsọm ghara idi nsọ, bú ihe-npako nke ike-unu, na ihe anya-unu abua nāchọsi ike, na ihe nke nkpuru-obi-unu nwere ọmiko n'aru ya; umu-unu ndikom na umu-unu ndinyom, ndi unu rapuworo, gāda kwa site na mma-agha. 22 Ma unu gēme dika m'meworo: unu agaghi-ekpuchi eb͕ub͕ere-ọnu-elu-unu, unu agaghi-eri kwa nri nke ndi ọzọ. 23 Ihe-ike-n'isi-unu gādi kwa unu n'isi, akpukpọ-ukwu-unu gādi kwa n'ukwu-unu: unu agaghi-eti aka n'obi, unu agaghi-akwa kwa ákwá; ma unu gāta aru n'ajọ omume nile unu, surita onwe-unu ude. 24 Ezikiel ewe ghọrọ unu ihe-ebube; dika ihe nile nke o meworo si di, otú a ka unu gēme: mb͕e nka gābia, unu ewe mara na Mu onwem bu Onye-nwe-unu Jehova. 25 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, ọ̀ gaghi-adi n'ubọchi mb͕e M'napuru ha ebe-ha siri ike, bú ihe-obi-utọ nke ima-nma-ha, na ihe anya-ha abua nāchọsi ike, na ihe ha buliworo nkpuru-obi-ha nye, bú umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom, 26 ọ̀ gaghi-adi n'ubọchi ahu na onye b͕apuru ab͕apu gābiakute gi, ime ka i were nti-gi abua nu ya? 27 N'ubọchi ahu ka agāsaghe ọnu-gi n'ebe onye b͕apuru ab͕apu nọ, i gēkwu kwa okwu, ghara ida kwa ob͕i ọzọ: i we ghọrọ ha ihe-ebube; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

Ezikiel 25

1 Okwu Jehova we ruem nti, si, 2 Nwa nke madu, che iru-gi n'ebe umu Amon nọ, bue amuma megida ha: 3 si umu Amon, Nurunu okwu nke Onye-nwe-ayi Jehova; Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na i siri, Ehe, megide ebe nsọm, mb͕e emere ya ka ọ ghara idi nsọ; na imegide ala Israel, mb͕e ọ tọb͕ọrọ n'efu; na imegide ulo Juda, mb͕e ha gara ije biri n'ala ọzọ: 4 n'ihi nka, le, M'gaje iwere gi nye umu Iru-anyanwu ibu ihe ha nwetara, ha gēdo kwa ebe-ulo-ikwū nile ha nime gi, me ebe-obibi nile ha nime gi; ndi ahu gēri nkpuru-gi, ọ bu kwa ndi ahu gāṅu miri-ara-ehi-gi. 5 M'gēme kwa ka Raba ghọ ebe-obibi nke camel, me kwa ka umu Amon ghọ ebe-nmakpu nke ìgwè ewu na aturu: unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova. 6 N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na i kuwo aka, zọ ukwu n'ala, ṅuria ọṅu na nleli-gi nile nime nkpuru-obi-gi megide ala Israel; 7 n'ihi nka, le, Mu onwem esetiwo akam n'aru gi, M'gēwere kwa gi nye ka i ghọrọ mba nile ihe-nluta-n'agha; M'gēbipu kwa gi n'aru ndi nile di iche iche, me ka i si n'ala nile la n'iyì: M'gēkpochapu gi: i we mara na Mu onwem bu Jehova. 8 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na Moab na Sia nāsi, Le, ulo Juda di ka mba nile; 9 n'ihi nka, le, M'gaje imeghe akuku Moab site n'obodo ahu nile, site n'obodo-ya nile nke di na nsọtu-ala-ya, nke bu ima-nma nke ala ahu, bú Bet-jeshimot, na Beal-meon, na Kiriataim, 10 nye umu Iru-anyanwu, tiyere umu Amon, M'gēwere kwa ya nye ka ọ buru ihe ha nwetara, ka ewe ghara icheta umu Amon n'etiti mba nile: 11 ọ bu kwa Moab ka M'gēme ihe nile ekpere n'ikpe; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova. 12 Otù a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na Edom emegidewo ulo Juda n'ibọ̀ ọ́bọ̀, na n'ihi na ikpe amawo ha nke-uku, ha we bọrọ onwe-ha ọbọ n'aru ha; 13 n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a, M'gēseti kwa akam n'aru Edom, bipu nime ya madu na anumanu, me ya nkpọnkpọ ebe site na Timan; ọbuná rue Dedan ka ha gāda na mma-agha. 14 M'gēsi kwa n'aka ndim, bú Israel, tukwasi Edom ibọ̀-ọ́bọ̀m; ha ewe me n'Edom dika iwem si di na dika ọnumam si di: ha ewe mara ibọ̀-ọ́bọ̀m; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 15 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na ndi Filistia emesowo Juda n'ibọ̀-ọ́bọ̀, bọ̀ ọ́bọ̀ na nlelì nke di nime nkpuru-obi-ha ibibi ya n'iro ebighi-ebi; 16 n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a, Le, M'gaje iseti akam n'aru ndi Filistia, bipu ndi Keret, me ka ndi ọnu-miri oké osimiri fọduru la n'iyì. 17 M'gēji kwa iba-nba nile nke ọnuma bọ̀ ha ọ́bọ̀ nile di uku; ha gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'gātukwasi ha ibọ̀-ọ́bọ̀m.

Ezikiel 26

1 O rue, n'arọ nke-iri-na-otù, n'ubọchi mbu nke ọnwa, na okwu Jehova rurum nti, si, 2 Nwa nke madu, n'ihi na Taia ekwuwo okwu megide Jerusalem, si, Ehe, etipiawo ya, bú obodo nke bu ọnu-uzọ ndi nile di iche iche; o chighariwo n'ebe m'nọ: m'gēju eju, emewo ya nkpọnkpọ ebe: 3 n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, Mu nēmegide gi, Taia, M'gēme kwa ka ọtutu mba rigota imegide gi, dika oké osimiri si eme ka nmali-miri-ya nile rigota. 4 Ha gēbibi kwa mb͕idi nile nke Taia, kwatue ulo-elu-ya nile: M'gākọchapu kwa ájá-ya n'aru ya, me ya ka ọ ghọ nkume di elu nke ihe nādighi ya. 5 Ebe ib͕asa ub͕u ka ọ gābu n'etiti oké osimiri; n'ihi na Mu onwem ekwuwo okwu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta): ọ gāghọ-kwa-ra mba nile ihe-nluta-n'agha. 6 Ma umu-ya ndinyom ndi nọ n'ọhia, agēji mma-agha b͕ue ha: ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova. 7 N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, M'gaje ime ka Nebukadreza, bú eze Babilon, si n'Ugwu biarue Taia, ọ bu eze nke ndi-eze, ọ gāchiri inyinya, chiri kwa ub͕ọ-ala, chiri kwa ndi-inyinya na nkpọkọta madu na ndi bara uba, bia. 8 Umu-gi ndinyom ndi nọ n'ọhia ka ọ gēji mma-agha b͕u: ọ gēwu kwa ulo-agha megide gi, wukọta obo-ihe imegide gi, welie ọta uku imegide gi. 9 Ọzọ, ihe-ya eji akwatu mb͕idi ka ọ gādọba imegide mb͕idi-gi nile, ọ bu kwa ulo-elu-gi nile ka o gēji mma-agha-ya kwada. 10 Site n'ìgwè inyinya-ya ájá-ha gēkpuchi gi: site n'olu ndi-inyinya, na nke wheel nākpọre akpọre, na nke ub͕ọ-ala, mb͕idi-gi nile gēme nkpatu, mb͕e ọ nābata n'ọnu-uzọ-ama-gi nile, dika esi abata n'obodo nke ab͕awara ab͕awa. 11 O gēji ukwu inyinya-ya nile zọtọ èzí-gi nile: ndi-gi ọ gēji mma-agha b͕u, ogidi nile nke ike-gi gārida n'ala. 12 Ha gākwata àkù-gi, luta ihe-izu-ahia-gi n'agha, kwatu mb͕idi-gi nile, ọ bu kwa ulo nile nke i nāchọsi ike ka ha gākwada: ọzọ, nkume-gi nile na osisi-gi nile awara awa na ájá-gi ka ha gātọb͕ọ n'etiti miri. 13 M'gēme kwa ka ùzù nke abù-gi nile kwusi; agaghi-anu kwa olu nke ubọ-akwara-gi nile ọzọ. 14 M'gēme kwa ka i ghọ nkume di elu nke ihe nādighi ya: ebe ib͕asa ub͕u ka i gābu; agaghi-ewu kwa gi ọzọ: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 15 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri Taia: Ọ̀ bughi site n'olu ọdida-gi, mb͕e ndi emeruru emeru nāsu ude, mb͕e anēb͕u eb͕u nke-uku n'etiti gi, ka agwe-etiti nile nēme nkpatu? 16 Ndi-isi nile nke oké osimiri gēsi n'oche-eze-ha ridata, chizuga uwe-nwuda-ha, ọ bu kwa uwe nile ha akpara nke-ọma ka ha gēyipu: ọma-jijiji nile ka ha gēyibe dika uwe; n'ala ka ha gānọdu, ma jijiji na ntabi-anya nile ọ bula, ihe-gi gēju kwa ha anya. 17 Ha gēbuli kwa abù-ákwá bayere gi, si gi, Le, otú i laworo n'iyì, gi obodo nke madu biri nime gi, bú ndi sitere n'oké osimiri nile, gi obodo nke anēto eto, nke diri ike n'oké osimiri, ya onwe-ya na ndi bi ya, ndi mere ka ndi nile ndi bi nime ya tua ujọ ha! 18 Ub͕u a ka agwe-etiti gāma jijiji n'ubọchi ọdida-gi; e, ibobo gānwu agwe-etiti nile nke di n'oké osimiri n'aru n'ọpupu-gi. 19 N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Mb͕e M'gēme gi nkpọnkpọ obodo, dika obodo nile nke madu nēbighi; mb͕e M'gēme ka ob͕u-miri rigokwasi gi, mb͕e ọtutu miri gēkpuchi gi; 20 M'gēme kwa ka i rida, gi na ndi nārida n'olùlù, ijekuru ndi nke mb͕e ebighi-ebi gara aga, M'gēme kwa ka i bi n'ala di n'okpuru uwa, n'ebe di nkpọnkpọ site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, gi na ndi nārida n'olùlù, ka madu we ghara ibi nime gi; M'gētiye kwa ima-nma n'ala ndi di ndu: 21 ihe-ima-jijiji ka m'gēme gi ka i buru, i gaghi-adi kwa ọzọ: agāchọ kwa gi, ma agaghi-achọta kwa gi ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

Ezikiel 27

1 Okwu Jehova we ruem nti, si, 2 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, buliere Taia abù-ákwá; 3 si Taia, Gi onye bi na ab͕ata oké osimiri, onye bu onye-ahia nke ndi nile di iche iche rue ọtutu agwe-etiti, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Taia, gi onwe-gi asiwo, Mu onwem bu ebe mazuru nma. 4 N'etiti oké osimiri ka ókè-ala-gi nile di, ndi wuworo gi emewo ka ima-nma-gi zue okè. 5 Osisi fir nke si na Senia aputa ka ha jiworo mere gi ibo-ub͕ọ nile: osisi cedar nke si na Lebanon aputa ka ha wereworo imere gi akpu-ub͕o. 6 Osisi oak nke si na Beshan aputa ka ha jiworo me umara-gi nile; oche-umara-gi ka ha jiworo ọdu, ekwukọyere n'osisi igbe nke si n'agwe-etiti Kitim aputa, me. 7 Ezi ákwà ọcha nke akpara nke-ọma, bú nke si n'Ijipt aputa, ka ákwà-ifufe-gi buworo, iburu gi ọkọlọtọ; ákwà anunu na ákwà ododo nke si n'agwe-etiti Elaisha aputa ka ákwà-ǹdò-gi buworo. 8 Ndi bi na Zaidon na Avad abuworo gi ndi-umara: ndi-gi ndi mara ihe, gi Taia, anọwo nime gi, ha onwe-ha bu ndi-ọ̀kà-ub͕ọ-gi. 9 Ndi-okenye Gebal na ndi-ya ndi mara ihe anọwo nime gi buru ndi nākwuchi oghere-ub͕ọ-gi: ub͕ọ nile nke oké osimiri na ndi-ub͕ọ-ha anọwo nime gi izu ahia gi. 10 Peasia na Lud na Put anọwo n'usu-ndi-agha-gi, ha bu ndi-agha-gi: ọta na okpu-agha ka ha kobere nime gi; ndi ahu gosiri ima-nma-gi. 11 Umu Avad na usu-ndi-agha-gi nọ n'elu mb͕idi-gi nile buruburu, Gamadim anọwo kwa n'ulo-elu-gi nile: ọta-ha ka ha kokwasiri na mb͕idi-gi nile buruburu; ndi ahu emewo ka ima-nma-gi zue oké. 12 Tashish bu onye-ahia-gi site n'iba-uba nke àkù nile ọ bula; ọla-ọcha na ígwè na b͕amb͕am na opù ka ha jiri zu ihe-izu-ahia-gi nile. 13 Jevan, na Tubal, na Meshek, ndi ahu bu ndi-ahia-gi: madu onwe-ha na ihe di iche iche nke ọla ka ha jiri zu ihe-izu-ahia-gi. 14 Ndi ulo Togama chiri inyinya na ndi-inyinya na inyinya mule zua ihe-ahia-gi nile. 15 Umu Dedan bu ndi-ahia-gi: ọtutu agwe-etiti bu ahia aka-gi: ezé enyi na osisi ebony ka ha butere dika ùtú-gi. 16 Siria bu Onye-ahia-gi site n'iba-uba nke ihe di iche iche i mere ire ere: emerald, na ákwà ododo, na ákwà akpara nke-ọma, na ezi ákwà ọcha, na coral, na ruby, ka ha jiri zu ihe-ahia-gi nile. 17 Juda na ala Israel, ndi ahu bu ndi-ahia-gi: ọka wheat nke Minit, na pannag, na manu-aṅu, na manu, na balm, ka ha jiri zu ihe-ahia-gi. 18 Damaskọs bu onye-ahia-gi n'ihi iba-uba nke i mere ire ere, site n'iba-uba nke àkù nile ọ bula; o jiri manya-vine Helbon na aji-anu di ọcha zu. 19 Vedan na Jevan nēwere ogho aturu atu zua ihe-ahia-gi nile: ígwè nwupuru enwupu, na cassia, na calamus, adiwo n'etiti ihe-izu-ahia-gi. 20 Dedan bu onye-ahia-gi n'ákwà sara mbara iji nọkwasi inyinya. 21 Arebia na ndi-isi nile nke Kida, ndi ahu bu ndi-ahia nke aka-gi; n'umu-aturu na ebulu na ewu, n'ihe ndia ka ha bu ndi-ahia-gi. 22 Ndi-ahia nke Sheba na Reama, ndi ahu bu ndi-ahia-gi: ha jiri uda kachasi uda nile nma, ji kwa nkume nile nke di oké ọnu-ahia, na ọla-edo, zua ihe-ahia-gi nile. 23 Heran na Kane na Eden, ndi-ahia Sheba, Asiria, Kilmad, ndia bu ndi-ahia-gi. 24 Ndi ahu bu ndi-ahia-gi n'ihe di iche iche mazuru nma, n'ulo ákwà anunu na ákwà akpara nke-ọma, na n'ib͕e juputara n'uwe turu agwa nke-ọma, nke eji udọ̀ ke were kwa osisi cedar me ha, n'etiti ihe-ahia-gi. 25 Ub͕ọ nile nke Tashish bu usu-ndi-ahia-gi iweta ihe-izu-ahia-gi: i we ju eju, di nsọpuru nke-uku n'etiti oké osimiri nile. 26 Ọ bu ọtutu miri ka ndi nānyà gi meworo gi ka i ba: ifufe Iru-anyanwu etiwawo gi n'etiti oké osimiri nile. 27 Àkù-gi, na ihe-ahia-gi nile, na ihe-izu-ahia-gi, na ndi-ọ̀kà-ub͕ọ-gi, na ndi nākwuchi oghere-ub͕ọ-gi, na ndi nāzu ahia-gi, na ndi-agha-gi nile, ndi nọ nime gi, na nime nkpọkọta-madu nile nke gi nke di n'etiti gi, gādabà n'etiti oké osimiri nile n'ubọchi ọdida-gi. 28 N'olu iti-nkpu nke ndi-ọ̀kà-ub͕ọ-gi azu-obodo-gi nile gēme nkpatu. 29 Ndi nile ndi nānya umara, na ndi-ub͕ọ, na ndi-ọ̀kà-ub͕ọ nile nke oké osimiri, gēsi kwa n'ub͕ọ-ha ridata, n'elu ala ka ha gēguzo, 30 me ka anuru olu-ha n'elu gi, tie nkpu ilu, kpokwasi ájá n'isi-ha, na ntu ka ha gāturu onwe-ha: 31 ha gēme-kwa-ra onwe-ha isi-nkwọcha n'ihi gi, ke ákwà-nkpe n'úkwù, kwara gi ákwá n'idi-ilu nke nkpuru-obi n'iti-aka-n'obi di ilu. 32 Ha gēbuliri gi abù-ákwá n'igo-ákwá-ha, bùara gi abù-ákwá, si, Ònye di ka Taia, ònye di ka obodo ahu nke emere ka o dere du n'etiti oké osimiri? 33 Mb͕e ihe-ahia-gi nile siri n'oké osimiri nile puta, i mere ka afọ ju ọtutu ndi di iche iche; i jiri iba-uba nke àkù-gi na nke ihe-izu-ahia-gi nile me ndi-eze nke uwa ka ha buru ọgaranya. 34 Na mb͕e etiwara gi site n'oké osimiri nile n'ebe miri emi nke miri, ihe-izu-ahia-gi na nkpọkọta-madu nile nke gi dara ada n'etiti gi. 35 I juwo ndi nile bi n'agwe-etiti nile anya, ndi-eze-ha atuwo ujọ nke-uku, iru-ha ab͕arusiwo. 36 Ndi-ahia n'etiti ndi nile di iche iche amawo gi ọsọ; oké egwu ka i ghọworo, i gaghi-adi kwa ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi.

Ezikiel 28

1 Okwu Jehova we ruem nti, si, 2 Nwa nke madu, si onye-ndú Taia, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na obi-gi adiwo elu, i we si, Chi ka m'bu, n'ọnọdu Chineke ka m'nānọkwasi, n'etiti oké osimiri nile; ma gi onwe-gi bu madu, i bughi Chineke, i we do obi-gi ka obi Chineke: 3 le, onye nke mara ihe ka i bu karia Daniel; ọ dighi ihe-nzuzo ha zonariworo gi: 4 i jiwo amam-ihe-gi, ji kwa nghọta-gi, lutara onwe-gi àkù, i we luta ọla-edo na ọla-ọcha n'àkù-gi nile: 5 i jiwo iba-uba nke amam-ihe-gi, ji kwa ọzuzu-ahia-gi, me ka àkù-gi ba uba, obi-gi we di elu n'ihi àkù-gi: 6 n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: N'ihi na i doworo obi-gi ka obi Chineke, 7 n'ihi nka, le, M'gēme ka ndi ala ọzọ biakwasi gi, bú ndi kachasi mba nile n'ime ka madu ma jijiji: ha gāmiputa kwa mma-agha-ha imegide ima-nma nke amam-ihe-gi, me ka onwunwu-ìhè-gi ghara idi nsọ. 8 Rue olùlù ka ha gēme ka i rida; i gānwu kwa ọnwu nke ndi eb͕uru eb͕u, n'etiti oké osimiri nile. 9 Ì gāsi n'ezie, Chineke ka m'bu, n'iru onye nēb͕u gi? ma gi onwe-gi bu madu, i bughi Chineke, n'aka onye nēme gi ka i ghara idi nsọ. 10 Ọnwu nke ndi anēbighi úgwù ka i gānwu site n'aka ndi ala ọzọ: n'ihi na Mu onwem ekwuwo okwu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 11 Okwu Jehova we ruem nti, si, 12 Nwa nke madu, buliere eze Taia abù-ákwá, si ya, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Gi onwe-gi bu onye nākachi ọtùtù-ihe akàrà, nke juputara n'amam-ihe, mazu kwa nma. 13 N'Iden, bú ubi Chineke ab͕ara ogige, ka i nọworo; nkume nile ọ bula nke di oké ọnu-ahia bu ihe-nkpuchi-gi: bú sardius, na topaz, na diamond, na beryl, na onyx, na jasper, na sapphire, na esmerald, na carbuncle, na ọla-edo: ije-ozi nke egwú-otiti-gi nile na ọ̀jà-gi nile di nime gi; n'ubọchi ekère gi, mb͕e ahu ka edoziri ha. 14 Gi onwe-gi bu cherub ahu etere manu nke nēkpuchi ekpuchi: M'we do gi, n'ugwu nsọ nke Chineke ka i nọrọ; n'etiti nkume ọku ka i jeghariworo. 15 Onye zuru okè ka i bu n'uzọ-gi nile n'ubọchi ekère gi, rue mb͕e ahuru ajọ omume nime gi. 16 Ha ejiwo iba-uba nke ọzuzu-ahia-gi mejue etiti-gi n'ihe-ike, i we mehie: M'we me ka i si n'ugwu Chineke pua dika ihe nādighi nsọ; M'we me ka i la n'iyì, gi cherub nke nēkpuchi ekpuchi, pua n'etiti nkume ọku. 17 Obi-gi adiwo elu n'ihi ima-nma-gi, i bibiwo amam-ihe-gi n'ihi onwunwu-ìhè-gi: n'ala ka M'tudaworo gi, n'iru ndi-eze ka M'tọb͕ọworo gi n'ala, ka ha we lekwasi gi. 18 Site n'iba-uba nke ajọ omume-gi, n'ajọ omume nke ọzuzu-ahia-gi, ka i meworo ebe nsọ gi ka ha ghara idi nsọ: M'we me ka ọku si n'etiti gi puta, nke ahu eripiawo gi, M'we me ka i ghọ ntu n'elu ala n'anya ndi nile nāhu gi. 19 I juwo ndi nile mara gi n'etiti ndi nile di iche iche anya: oké egwu ka i ghọworo, i gaghi-adi kwa ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi. 20 Okwu Jehova we ruem nti, si, 21 Nwa nke madu, che iru-gi n'ebe Zaidon di, bue amuma megide ya, 22 si, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu nēmegide gi, Zaidon; ewe sọpurum n'etiti gi: ha gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'mesiri nime ya ihe nile ekpere n'ikpe, ewe dom nsọ nime ya. 23 N'ihi na Mu onwem gēzite ajọ ọria nēfe efe na ọbara nime ya n'èzí-ya nile; ndi eb͕uru eb͕u gāda kwa n'etiti ya mb͕e mma-agha di n'aru ya buruburu; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova. 24 Uke nke nādu adu agaghi-adi-kwa-ra ulo Israel ọzọ, ogwu nke nēb͕u nb͕u agaghi-adi kwa sitere na ndi nile nọ ha buruburu, ndi nēlelì ha; ha ewe mara na Mu onwem bu Onye-nwe-unu Jehova. 25 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Mb͕e M'gāchikọputawori ulo Israel n'etiti ndi nile di iche iche, bú ndi ha b͕asaworo n'etiti ha, mb͕e agēdoworim nsọ nime ha n'anya mba nile, ha gēbi kwa n'elu ala-ha, nke M'nyere orùm, bú Jekob. 26 Ha gēbi n'elu ya na ntukwasi-obi; ha gēwu kwa ulo, kua ubi-vine, biri na ntukwasi-obi; mb͕e M'mesiri ihe nile ekpere n'ikpe n'aru ndi nile nēlelì ha n'ebe nile di ha buruburu; ha ewe mara na Mu onwem bu Onye-nwe-ha Jehova.

Ezikiel 29

1 N'arọ nke-iri, n'ọnwa nke-iri, n'ubọchi nke-iri-na-abua nke ọnwa ahu, okwu Jehova rurum nti, si, 2 Nwa nke madu, che iru-gi imegide Fero, bú eze Ijipt, bue amuma megide ya, megide kwa Ijipt nile: 3 Kwue okwu, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu nēmegide gi, Fero, eze Ijipt, bú ogologo anu ahu nke nāmakpu n'etiti osimiri Nail-ya nile, nke siworo, Mu nwe Nail nkem, ọ bu kwa mu onwem mere ya n'onwem. 4 M'gētiye kwa nb͕a-aka-imi n'àb͕à-gi abua, me ka azù nke osimiri Nail i nile rapara n'akpirikpa-gi; M'gēme kwa ka i si n'etiti osimiri Nail i nile rigoputa, gi na azù nile nke osimiri Nail i nile nke nārapara n'akpirikpa-gi. 5 M'gātusa kwa gi n'ọzara, gi na azù nile nke osimiri Nail i nile: n'ọhia ka i gāda; agaghi - achikọta gi, agaghi-ekpokọta kwa gi: anu-ọhia nke uwa na anu-ufe nke elu-igwe ka M'wereworo gi nye ka i ghọ ihe-oriri. 6 Ndi nile bi n'Ijipt gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, n'ihi na ha aburuworo ulo Israel nkpa-n'aka nke bu nání amì. 7 Mb͕e ha jidere gi n'aka, i we nyajie, dọwara ha ubu nile: na mb͕e ha dabere gi, i we b͕ajie, me ka úkwù nile guzoro ha. 8 N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, M'gaje ime ka mma-agha biakwasi gi, M'gēbipu kwa madu na anumanu nime gi. 9 Ala Ijipt gāghọ kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu na nkpọnkpọ ebe; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova: n'ihi na ọ siwo, Mu nwe osimiri Nail, ọ bu kwa onwem mere ya. 10 N'ihi nka, le, Mu nēmegide gi, megide kwa osimiri Nail i nile, M'gēme kwa ka ala Ijipt ghọ nání nkpọnkpọ ebe nkpọnkpọ ebe na ebe tọb͕ọrọ n'efu, site na Migdol rue Sevene, ọbuná rue ókè-ala Etiopia. 11 Ọ dighi ukwu madu gāgabiga nime ya, ọ dighi kwa ukwu anumanu gāgabiga nime ya, agaghi-ebi kwa nime ya ọgu arọ abua. 12 M'gēme kwa ala Ijipt ebe tọb͕ọrọ n'efu n'etiti ala nile tọb͕ọrọ n'efu, ọzọ, obodo-ya nile nke di n'etiti obodo nile nke emeworo nkpọnkpọ ebe gābu ebe tọb͕ọrọ n'efu ọgu arọ abua: M'gāchusa kwa ndi Ijipt n'etiti mba nile, fesa ha n'ala nile. 13 N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ọgwugwu ọgu arọ abua ka M'gāchikọputa ndi Ijipt nime ndi nile di iche iche ebe achusara ha: 14 M'gēme kwa ka ndi Ijipt adọtara n'agha laghachi, M'gēme kwa ka ha laghachi n'ala Patros, n'ala nputa-n'uwa-ha; ha ewe nọ n'ebe ahu, buru ala-eze di ala. 15 Ọ gādi ala kari ala-eze nile; ọ gaghi-ebuli kwa onwe-ya ọzọ n'elu mba nile: M'gēme kwa ka ha di ole-na-ole, ka ha ghara inwe ike n'aru mba nile. 16 Ọ gaghi-abu-kwa-ra ulo Israel ihe-ntukwasi-obi nēme ka echeta ajọ omume, mb͕e ha nēche iru ile ha anya n'azu: ha ewe mara na Mu onwem bu Onye-nwe-ha Jehova. 17 O rue, n'arọ nke-oru-na-asa, n'ọnwa mbu, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, na okwu Jehova rurum nti, si, 18 Nwa nke madu, Nebukadreza, bú eze Babilon, mere ka usu-ndi-agha-ya fè òfùfè uku megide Taia: isi nile ọ bula ka emere isi-nkwọcha, ubu nile ọ bula ka echihiara echihia: ma ọ dighi ugwọ-ọlu ọ natara, ọ dighi kwa nke usu-ndi-agha-ya natara, n'aka Taia, n'ihi òfùfè ahu o fère megide ya. 19 N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, M'gaje inye Nebukadreza, bú eze Babilon, ala Ijipt; ọ gāchilaga kwa ìgwè ndi-ya, kwata ihe-nkwata-ya, luta ihe-nluta-ya n'agha; o we buru ugwọ-ọlu agākwu usu-ndi-agha-ya. 20 Enyewom ya ala Ijipt ibu ihe ọ lutara n'ọlu, bú nke o fère òfùfè n'ihi ya, n'ihi na ha lurum ọlu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 21 N'ubọchi ahu ka M'gēme ka otù mpi puere ulo Israel, ọ bu kwa gi ka M'gēnye nsaghe-ọnu n'etiti ha; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

Ezikiel 30

1 Okwu Jehova we ruem nti, si, 2 Nwa nke madu, bue amuma, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Kwasienu ákwá ike, si, Azib͕a ub͕ochi ahu! 3 N'ihi na ubọchi di nso, ọ di nso, bú ubọchi Jehova nwere, ọ bu ubọchi igwe-oji; mb͕e nke mba di iche iche ka ọ gābu. 4 Mma-agha gābiakwasi kwa n'Ijipt, ihe-nb͕ali gādi kwa n'Etiopia, mb͕e ndi eb͕uru eb͕u gāda n'Ijipt; ha ewe chipu ìgwè ndi-ya, kwatue ntọ-ala-ya nile. 5 Etiopia, na Put, na Lud, na ndi nile gwara ọgwa, na Kub, na umu nke ala nke ọb͕ub͕a-ndu ahu, gēso ha da site na mma-agha. 6 Otú a ka Jehova siri: Ndi nākwagide Ijipt gāda kwa, npako nke ike-ya gārida kwa: site na Migdol rue Sevene, ọ bu site na mma-agha ka ha gāda nime ya; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 7 Ha gātọb͕ọrọ kwa n'efu n'etiti ala nile nke tọb͕ọrọ n'efu, obodo-ya nile gādi kwa n'etiti obodo nile nke bu nkpọnkpọ. 8 Ha gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'tiyesiri ọku n'Ijipt, na mb͕e etijisiri ndi nile nēyere ya aka. 9 N'ubọchi ahu ndi-ozi gēsi n'irum pua je n'ub͕ọ di iche iche ime ka Etiopia ma jijiji, bú ndi nọ na ntukwasi-obi; ihe-nb͕ali gādi kwa n'aru ha, dika n'ubọchi Ijipt, n'ihi na, le, ọ nābia. 10 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: M'gēme kwa ka ìgwè ndi Ijipt kwusi, n'aka Nebukadreza, bú eze Babilon. 11 Ya onwe-ya na ndi-ya so ya, bú ndi kachasi mba nile n'ime ka madu ma jijiji, agaje ime ka ha bata ibibi ala ahu; ha gāmiputa kwa mma-agha-ha imegide Ijipt, ha gēmeju kwa ala ahu na ndi eb͕uru eb͕u. 12 M'gēme kwa ka osimiri Nail nile ghọ ebe kpọrọ nku, M'gēre kwa ala ahu n'aka ndi ọjọ, me ka ala ahu na ùjú-ya tọb͕ọrọ n'efu, site n'aka ndi ala ọzọ: Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu. 13 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: M'gēme kwa ka arusi nile la n'iyì, M'gēme kwa ihe-efu nile kwusi na Nof; ọ dighi kwa onye-isi gēsi n'ala Ijipt puta ọzọ: M'gētiye kwa egwu n'ala Ijipt. 14 M'gēme kwa ka Patros tọb͕ọrọ n'efu, M'gētiye kwa ọku nime Zoan, me kwa ihe nile ekpere ikpe nime No. 15 M'gāwukwasi kwa ọnumam nime Sin, bú ebe siri ike nke Ijipt; M'gēbipu igwè ndi No. 16 M'gētiye kwa ọku n'Ijipt; Sin gāb͕ali nke-uku, No ka agētipu: Nof gēnwe kwa ndi-nkpab͕u ogologo ubọchi nile. 17 Umu-okorọbia nke Even na Pi-beset gāda site na mma-agha: obodo ndia gāla na ndọta-n'agha. 18 Ọ bu kwa na Tehafnehes ka ubọchi gāb͕a ọchichiri, mb͕e M'gāb͕aji yoke nile nke Ijipt n'ebe ahu, npako nke ike-ya gākwusi kwa nime ya: ya onwe-ya, igwe-oji gēkpuchi ya, umu-ya ndinyom gāla kwa na ndọta-n'agha. 19 M'gēme kwa ihe nile ekpere n'ikpe n'Ijipt: ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova. 20 O rue, n'arọ nke iri-na-otù, n'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-asa nke ọnwa ahu, na okwu Jehova rurum nti, si, 21 Nwa nke madu, ogwe-aka nke Fero, bú eze Ijipt, ka m'b͕ajiworo; ma, le, ekegideghi ya itiye ọgwù-ọgwugwọ di iche iche, ido ákwà-ọkiké ikegide ya, ka o we sie ike ijide mma-agha. 22 N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, Mu nēmegide Fero, bú eze Ijipt, M'gāb͕aji kwa ogwe-aka-ya abua, ma nke siri ike, ma nke b͕ajiri ab͕aji; M'gēme kwa ka mma-agha-ya si n'aka-ya da. 23 M'gāchusa kwa ndi Ijipt n'etiti mba nile, fesa kwa ha n'ala nile. 24 M'gēme kwa ka ogwe-aka abua nke eze Babilon sie ike, M'gētiye kwa mma-agham n'aka-ya: ma M'gāb͕aji ogwe-aka abua nke Fero, ọ gāsu kwa ude nke onye emeruru aru nke-uku n'iru ya. 25 M'gēme kwa ka ogwe-aka abua nke eze Babilon sie ike, ma ogwe-aka abua nke Fero gāda; ha gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'gētiye mma-agham n'aka eze Babilon, ọ we setipu ya n'ebe ala Ijipt di. 26 M'gāchusa kwa ndi Ijipt n'etiti mba nile, fesa kwa ha n'ala nile; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

Ezikiel 31

1 O rue, n'arọ nke-iri-na otù, n'ọnwa nke-atọ, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, na okwu Jehova rurum nti, si, 2 Nwa nke madu, Si Fero, bú eze Ijipt, si kwa ìgwè ndi-ya; Ònye ka i yiri n'idi-uku-gi? 3 Le, Asiria bu osisi cedar nime Lebanon nke nwere ngalaba mara nma, na ọtutu alaka nēnye ǹdò, na ogologo di elu; ọ bu kwa n'etiti alaka b͕ara ọhia ka ọnu-ọnu-ya di. 4 Miri mere ya ka o bùe ibù, ob͕u-miri mere ya ka ọ di elu: osimiri-ya nile nāga ebe-ya akuku ihe buruburu; uzọ-miri-ya nile ka o zigara osisi nile nke ọhia. 5 N'ihi nka ka ogologo-ya di elu kari osisi nile nke ọhia; eme-kwa-ra ka ngalaba-ya ba uba, alaka-ya nile to-kwa-ra ogologo site n'ọtutu miri, mb͕e ọ waputara ha. 6 Na ngalaba-ya nile ka anu-ufe nile nke elu-igwe luru akwu, ọ bu kwa n'okpuru alaka-ya nile ka anu ọhia nile muru umu, ọ bu kwa na ǹdò-ya ka oké mba nile biri. 7 Ọ we ma nma n'idi-uku-ya, n'ogologo nke alaka-ya nile: n'ihi na nkpọrọgwu-ya adiwo n'ebe ọtutu miri di. 8 Osisi cedar nile nke di n'ubi Chineke ab͕ara ogige ezoghi ya: osisi fir nile eyighi ngalaba-ya nile, osisi plane nile adighi kwa ka alaka-ya nile; ọ dighi kwa osisi ọ bula nke di n'ubi Chineke ab͕ara ogige nke yiri ya n'ima-nma-ya. 9 Ihe nke mara nma ka M'mere ya ka ọ ghọ n'iba-uba nke alaka-ya: osisi nile nke Iden, nke di n'ubi Chineke nke ab͕ara ogige, we kwoso ya ekworo. 10 N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: N'ihi na i di elu n'ogologo, na n'ihi na o tiyewo ọnu-ọnu-ya n'etiti alaka b͕ara ọhia, na n'ihi na obi-ya di elu n'idi-elu-ya; 11 M'gēnye kwa ya n'aka onye di ike nke mba nile; ọ ghaghi imeso ya: n'ihi nmebi-iwu-ya ka M'chupuworo ya. 12 Ndi ala ọzọ, bú ndi kariri mba nile n'ime ka madu ma jijiji, we bipu ya, tusa ya: n'elu ugwu nile na nime ndagwurugwu nile ka alaka-ya daworo, ewe nyajie alaka-ya nile nke akwukwọ-ha kpuchiri ha n'ebe nile miri si erù nke ala-ya; ndi nile nke ala ahu esiwo kwa na ǹdò-ya rida, ha we tusa ya. 13 N'elu ihe-ya dara ada ka anu-ufe nile nke elu-igwe gēbi, ọ bu kwa n'alaka-ya nile ka anu ọhia nile gādi: 14 ka osisi nile nke miri we ghara idi elu n'ogologo-ha, ghara kwa itiye ọnu-ọnu-ha rue etiti alaka b͕ara ọhia, ka ndi-ha ndi di ike we ghara iguzo n'idi-elu-ha, bú ndi nile nāṅu miri: n'ihi na ha nile ka ewereworo nye ọnwu, ijeru ala di n'okpuru uwa, n'etiti umu nke madu, ijekuru ndi nārida n'olùlù. 15 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ubọchi mb͕e ọ ridaruru n'ala-mọ emerem ka erue újú: ekpuchirim ob͕u-miri n'ihi ya, eb͕ochi-kwa-ram osimiri-ya nile, ewe b͕ochibido ọtutu miri: eme-kwa-ram ka Lebanon yiere ya uwe-nkpe, osisi nile nke ọhia tubọ-kwa-ra atubọ n'ihi ya. 16 Emerem ka mba nile me nkpatu site n'olu nke ọdida-ya, mb͕e M'mere ka ọ ridarue ala-mọ, ya na ndi nārida n'olùlù: ewe kasie osisi nile nke Iden obi n'ala di n'okpuru uwa, bú osisi arọputara arọputa kachasi kwa nma na Lebanon, ndi nile nke nāṅu miri. 17 Ha onwe-ha so-kwa-ra ya ridarue ala-mọ, jekuru ndi ejiri mma-agha b͕u; e, ndi bu ogwe-aka-ya, ndi biri na ǹdò-ya n'etiti mba nile. 18 Ònye ka i yiri otú a nime nsọpuru na n'idi-uku n'etiti osisi nile nke Iden? ma emewo ka i rida, gi na osisi nile nke Iden, rue ala di n'okpuru uwa: n'etiti ndi anēbighi úgwù ka i gēdina, gi na ndi ejiri mma-agha b͕u. Nka bu Fero-na ìgwè ndi-ya nile; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

Ezikiel 32

1 O rue, n'arọ nke-iri-na-abua, n'ọnwa nke-iri-na-abua, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, na okwu Jehova rurum nti, si, 2 Nwa nke madu, buliere Fero, bú eze Ijipt, abù-ákwá, si ya, Nwa-ọdum nke mba nìle ka i yiworo: ma gi onwe-gi di ka ogologo anu n'oké osimiri nile; i we waputa n'osimiri-gi nile, ji ukwu-gi, b͕arua miri, zọrua osimiri nile ha. 3 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: M'gāchiri nkpọkọta ọtutu ndi di iche iche b͕asa ub͕um n'elu gi; ha gādọgota kwa gi n'ub͕um. 4 M'gātusa kwa gi n'ala-gi, n'ọhia ka M'gētufu gi, me kwa ka anu-ufe nile nke elu-igwe bekwasi gi, M'gēme kwa ka anu-ọhia nke uwa nka nile riju afọ site n'anu-aru-gi. 5 M'gētiyekwasi kwa anu-aru-gi n'ugwu nile, were kwa idi-elu-gi mejue ndagwurugwu nile. 6 M'gēde kwa ọbara-gi n'ala dika miri, bú ebe i nēgwu miri, rue ugwu nile; ebe nile miri si erù gējuputa na gi. 7 Mb͕e M'nēmenyu gi, M'gēkpuchi elu-igwe, me ka kpakpando nile ha jie nji; anyanwu ka M'gēkpuchi n'igwe-oji, ọnwa agaghi-enye kwa ìhè-ya. 8 Ihe nile nke nēnye ìhè n'elu-igwe ka M'gēme ka ha jie nji n'elu gi, M'gētiyekwasi kwa ọchichiri n'ala-gi; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 9 M'gākpasu kwa obi nke ọtutu ndi di iche iche, mb͕e M'gēme ka ntipia-gi bia n'etiti mba nile, rue ala di iche iche nke i nāmaghi. 10 M'gēme kwa ka i ju ọtutu ndi anya, ndi-eze-ha gāma jijiji bayere gi nke-uku, mb͕e M'gēfeghari mma-agham n'iru ha; ha gāma kwa jijiji na ntabi-anya nile ọ bula, onye ọ bula n'ihi ndu-ya, n'ubọchi nke ọdida-gi. 11 N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Mma-agha nke eze Babilon gābiakwasi gi. 12 ọ bu site na mma-agha nile nke ndi-dike ka M'gēme ka ìgwè ndi-gi da; ndi kariri mba nile n'ime ka madu ma jijiji ka ha nile bu: ọ bu kwa ihe-npako nke Ijipt ka ha gāpunara ya, ewe kpochapu ìgwè ndi-ya nile. 13 M'gēme kwa ka anumanu-ya nile si n'akuku ọtutu miri la n'iyì; ukwu madu agaghi-ab͕aru kwa ha ọzọ, ukwu anumanu agaghi-ab͕aru kwa ha. 14 Mb͕e ahu ka M'gēme ka miri-ha do, me kwa ka osimiri nile ha rùe erù dika manu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 15 Mb͕e m'gēme ala Ijipt ebe tọb͕ọrọ n'efu na ihe-iju-anya, ala b͕a aka n'ihe juru ya-ri, mb͕e M'gētib͕u ndi nile bi ya, ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova. 16 Abù-ákwá ka nka bu, nke ha gābù; umu-ndinyom nke mba nile gābù ya: n'ihi Ijipt na n'ihi ìgwè-ya nile ka ha gābù ya; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 17 O rue, n'arọ nke-iri-na-abua, n'ubọchi nke-iri-na-ise ọnwa ahu, na okwu Jehova rurum nti, si, 18 Nwa nke madu, bùara ìgwè ndi Ijipt abù ákwá, me ka ha rida, ya na umu-ndinyom nke mba di iche iche di ebube, rue ala di n'okpuru uwa, ha na ndi nārida n'olùlù. 19 Ònye ka i tọkariri n'utọ? rida, ka eme kwa ka i soro ndi anēbighi úgwù dina. 20 N'etiti ndi ejiri mma-agha b͕u ka ha gāda: ewerewo ya nye mma-agha: kpupunu ya na ìgwè ndi-ya nile. 21 Ndi di ike nke ndi-dike gēsi n'etiti ala-mọ gwa ya okwu, ha na ndi nēyere ya aka: ha aridawo, ha edinawo ala, bú ndi anēbighi úgwù, ndi ejiri mma-agha b͕u. 22 N'ebe ahu ka Asiria na nkpọkọta ndi ya nile di; n'ebe nile di ya buruburu ka ílì-ya nile di: ha nile bu ndi eb͕uru eb͕u, ndi daworo site na mma-agha: 23 ndi etiyere ílì nile ha na nsọtu nile nke olùlù, nkpọkọta ndi-ya di ílì-ya buruburu: ha nile bu ndi eb͕uru eb͕u, ndi daworo site na mma-agha, bú ndi mere ka ujọ di n'ala ndi di ndu. 24 N'ebe ahu ka Ilam na ìgwè ndi-ya nile ndi nọ ílì-ya buruburu di: ha nile bu ndi eb͕uru eb͕u, ndi daworo site na mma-agha, ndi ridara n'ebighi-úgwù rue ala di n'okpuru uwa, bú ndi mere ka ujọ-ha di n'ala ndi di ndu, we būru ihere-ha, ha na ndi nārida n'olùlù. 25 N'etiti ndi eb͕uru eb͕u ka ha nyeworo ya ihe-ndina n'etiti ìgwè ndi-ya nile; n'ebe nile di ya buruburu ka ílì-ya nile di: ha nile bu ndi anēbighi úgwù, ndi ejiri mma-agha b͕u; n'ihi na emere ka ujọ-ha di n'ala ndi di ndu, ha we būru ihere-ha, ha na ndi nārida n'olùlù: n'etiti ndi eb͕uru eb͕u ka etiyeworo ya. 26 N'ebe ahu ka Meshek na Tubal na ìgwè ndi-ya nile nọ; n'ebe nile nke di ya buruburu ka ílì-ya nile di: ha nile bu ndi anēbighi úgwù, ndi ejiri mma-agha b͕u; n'ihi na ha mere ka ujọ-ha di n'ala ndi di ndu. 27 Ha agaghi-esoro ndi-dike dina, bú ndi dara ada site na ndi anēbighi úgwù, ndi ridaworo n'ala-mọ chiri ihe-agha-ha, ha we tọb͕ọrọ mma-agha-ha n'okpuru isi-ha, ajọ omume nile ha dikwasi n'ọkpukpu-ha; n'ihi na ujọ ndi-dike ka ha bu n'ala ndi di ndu. 28 Ma gi onwe-gi, n'etiti ndi anēbighi úgwù ka agētipia gi, i gēso kwa ndi ejiri mma-agha b͕u dina. 29 N'ebe ahu ka Edom na ndi-eze-ya na ndi-isi-ya nile nọ, ndi atọb͕ọworo n'idi-ike-ha n'etiti ndi ejiri mma-agha b͕u: ndi ahu gēsoro ndi anēbighi úgwù, so kwa ndi nārida n'olùlù, dina. 30 N'ebe ahu ka ndi-isi Ugwu nọ, ha nile, na ndi Zaidon nile, ndi soro ndi eb͕uru eb͕u rida; n'ujọ-ha nke ha mere ka atua site n'idi-ike-ha ka ihere nēme ha; ha ewe soro ndi ejiri mma-agha b͕u dina n'ebighi-úgwù, būru ihere-ha, ha na ndi nārida n'olùlù. 31 Ndi ahu ka Fero gāhu, ewe kasie ya obi bayere ìgwè ndi-ya nile: ha bu ndi ejiri mma-agha b͕u, bú Fero na usu-ndi-agha-ya nile; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 32 N'ihi na emewom ka ujọ-ya di n'ala ndi di ndu: agēme kwa ka o dina n'etiti ndi anēbighi úgwù, ya na ndi ejiri mma-agha b͕u, bú Fero na ìgwè ndi-ya nile; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

Ezikiel 33

1 Okwu Jehova we ruem nti, si, 2 Nwa nke madu, gwa umu ndi-gi okwu, si ha, Ala ọ bula, mb͕e M'nēme ka mma-agha biakwasi ya, ma ndi ala ahu eweputawo otù onye n'etiti ha, me ya ka ọ ghọrọ ha onye-nche: 3 ọ we hu mma-agha ahu ka ọ nābiakwasi ala-ya, o buru na ọ fùa opì-ike-ya, dọ ndi-ya aka na nti; 4 mb͕e ahu onye nānu ihe nke nuworo olu opì-ike ahu, ma ọ naraghi idọ-aka-na-nti-ya, ọ buru na mma-agha ahu abia wepu ya, ọbara-ya gādi n'isi-ya. 5 Olu opì-ike ahu ka ọ nuru, ma ọ naraghi idọ-aka-na-nti-ya; ọbara-ya gādikwasi ya: ma onye ahu, asi na ọ nara idọ-aka-na-nti ahu, nkpuru-obi-ya ka ọ gēmewori ka o wepuga onwe-ya. 6 Ma onye-nche ahu, mb͕e ọ gāhu mma-agha ahu ka ọ nābia, ma ọ fùghi opì-ike, ewe ghara idọ ndi-ya aka na nti, mma-agha ahu abia, wepu madu ọ bula n'etiti ha; onye ahu, n'ihi ajọ omume-ya ka ewepuworo ya, ma n'aka onye-nche ahu ka M'gājuta ọbara-ya. 7 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, onye-nche ka M'doworo gi nye ulo Israel; i gānu kwa okwu site n'ọnum, dọ ha aka na nti site nam. 8 Mb͕e M'nāsi onye nēmebi iwu, Gi onye nēmebi iwu, i ghaghi inwu, ma i kwughi kwa okwu idọ onye nēmebi iwu aka na nti ka o si n'uzọ-ya puta; onye ahu nke nēmebi iwu gānwu n'ajọ omume-ya; ma n'aka-gi ka M'gājuta ọbara-ya. 9 Ma gi onwe-gi, mb͕e i gādọ onye nēmebi iwu aka na nti ka o si n'uzọ-ya puta ka o we si nime ya chigharia, ma o sighi n'uzọ-ya chigharia; onye ahu gānwu n'ajọ omume-ya, ma gi onwe-gi, nkpuru-obi-gi ka i naputaworo. 10 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, si ulo Israel: Otú a ka unu nēkwu, si, N'ezie njehie nile ayi na nmehie nile ayi di n'isi-ayi, ọ bu kwa nime ha ka ayi onwe-ayi nāta aru; àyi gēsi kwa aṅa di ndu? 11 Si ha, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), ọnwu nke onye nēmebi iwu adighi-atọm utọ ma-ọli; kama ọ nātọm utọ mb͕e onye nēmebi iwu si n'uzọ-ya chigharia, we di ndu: chigharianu, sinu n'uzọ ọjọ nile unu chigharia; ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka unu gānwu, ulo Israel? 12 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, si umu ndim, Ezi omume nke onye ezi omume agaghi-anaputa ya anaputa n'ubọchi njehie-ya; ọzọ, nmebi-iwu nke onye nēmebi iwu, ọ gaghi-asu ngọngọ nime ya n'ubọchi o si na nmebi-iwu-ya chigharia: ọzọ kwa, onye ezi omume apughi idi ndu nime ya n'ubọchi o mehiere. 13 Mb͕e M'nāsi onye ezi omume, na ọ ghaghi idi ndu, onye ahu ewe tukwasi obi n'ezi omume-ya, me ajọ omume, ezi omume-ya nile, agaghi-echeta ha; ma n'ajọ omume-ya nke o meworo, nime ya ka ọ gānwu. 14 Ọzọ, mb͕e M'nāsi onye nēmebi iwu, I ghaghi inwu; o we si na nmehie-ya chigharia, me ihe ekpere n'ikpe na ezi omume; 15 asi na onye nēmebi iwu enyeghachi ihe-ibe, kwughachi ihe ọ punara madu n'ike, jegharia n'ukpuru nile nke ndu, ghara ime ajọ omume; ọ ghaghi idi ndu, ọ gaghi-anwu. 16 Nmehie-ya nile nke o mehieworo agaghi-echeta ha megide ya: ihe ekpere n'ikpe na ezi omume ka o meworo; ọ ghaghi idi ndu. 17 Ma umu ndim asiwo, Adighi-atule uzọ Onye-nwe-ayi: ma ha onwe-ha, uzọ-ha ka anādighi-atule. 18 Mb͕e onye ezi omume si n'ezi omume-ya chigharia, me ajọ omume, ọ gānwu kwa nime ha. 19 Ma mb͕e onye nēmebi iwu si na nmebi-iwu-ya chigharia, me ihe ekpere n'ikpe na ezi omume, n'ihi ihe ndia ka onye ahu gādi ndu. 20 Ma unu asiwo, Adighi-atule uzọ Onye-nwe-ayi. M'gēkpe unu ikpe, unu ulo Israel, onye ọ bula ka uzọ-ya nile si di. 21 O rue, n'arọ nke-iri-na-abua nke emere ka ayi je biri n'ala ọzọ, n'ọnwa nke-iri, n'ubọchi nke-ise nke ọnwa ahu, na otù onye nke siri na Jerusalem b͕apu biakuterem, si, Etikpọwo obodo-ayi. 22 Ma aka Jehova rurumri aru n'anyasi, tutu onye b͕apuru ab͕apu abia; O we saghe ọnum, rue mb͕e ọ biakuterem n'ututu; ewe saghe ọnum, m'we ghara ida kwa ob͕i ọzọ. 23 Okwu Jehova we ruem nti, si, 24 Nwa nke madu, ndi bi na nkpọnkpọ ebe ndia n'ala Israel nēkwu, si, Nání otù onye ka Abraham bu, o we nweta ala nka: ma ayi onwe-ayi bara uba; ayi ka enyeworo ala nka ibu ihe-nweta. 25 N'ihi nka si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Anu na ọbara-ya ka unu nēri, unu nēweli kwa anya-unu le arusi nile unu, ọbara ka unu nāwusi kwa: ọ̀ kwa ala nka ka unu gēnweta? 26 Unu eguzowo n'elu mma-agha-unu, unu emewo ihe-árú, unu emeruwo, nwoke ọ bula o merua nwunye nke nwoke-ibe-ya: ọ̀ bu kwa ala nka ka unu gēnweta? 27 Otú a ka i gāsi ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Mu onwem nādi ndu, n'ezie ndi nọ na nkpọnkpọ ebe nile gāda site na mma-agha, M'gēwere kwa onye nọ n'ọhia nye anu-ọhia ka ewe ripia ya, na ndi nọ n'ebe nile ewusiri ike na n'ọb͕à nile, n'ajọ ọria nēfe efe ka ha gānwu. 28 M'gēme kwa ka ala-unu ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu na ihe-iju-anya, npako nke ike-ya gākwusi kwa; ugwu nile nke Israel gātọb͕ọ kwa n'efu, ghara inwe onye nāgabiga ha. 29 Ha gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'mesiri ala-ha ka ọ ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu na ihe-iju-anya, n'ihi ihe-árú nile ha nke ha meworo. 30 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, umu ndi-gi ndi nēkwu okwu bayere gi n'akuku mb͕idi nile ha, na n'ọnu-uzọ nile nke ulo nile ha, ha agwaritawo onwe-ha okwu, onye ọ bula ọ gwa nwa-nne-ya, si, Biko, bianu, nuru ihe bu okwu a nke nēsi n'ọnu Jehova puta. 31 Ha we nābiakute gi dika ọbibia nke otù ndi, nọdu ala n'iru-gi dika ndim, ha nānu kwa okwu-gi nile, ma okwu-gi ndia ka ha nēmegh: n'ihi na ihu-n'anya riri nne ka ndi ahu ji ọnu-ha egosi, ma urù-ha nke nēzighi ezi ka obi-ha nējeso. 32 Ma, le, i diri ha ka abù nke ihu-n'anya riri nne, dika onye nwere olu mara nma, nke nākpọ kwa ubọ nke-ọma: n'ihi na ha anuwo okwu-gi nile, ma ha adighi-eme ha. 33 Ma mb͕e ọ gēme, (le, ọ nēme, ) ha gāma kwa na onye-amuma anọwori n'etiti ha.

Ezikiel 34

1 Okwu Jehova we ruem nti, si, 2 Nwa nke madu, bue amuma megide ndi-ọzùzù-aturu nāzù Israel, bue amuma, si ha, bú ndi-ọzùzù-aturu ahu, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ahuhu diri ndi-ọzùzù-aturu nāzù Israel ndi nọworo nāzù onwe-ha! ọ̀ bughi ìgwè ewu na aturu ka ndi-ọzùzù-aturu gāzù? 3 Abuba-ha ka unu nēri, aji-ha ka unu nēyi, anu nke mara abuba nime ha ka unu nēb͕u; ma ìgwè ewu na aturu ka unu nāzùghi. 4 Unu emeghi ka ndi aru-ha nādighi ike di ike, unu agwọghi kwa nke nāria ọria, unu ekezighi kwa ọkpukpu b͕ajiri ab͕aji, unu eweghachighi kwa nke achufuru achufu, unu achọghi kwa nke furu efu; kama n'ike na nkpab͕u ka unu zọdaworo ha. 5 Ha we b͕asa, n'ihi na onye-ọzùzù-aturu anọgh: ha we ghọrọ anu ọhia nile ihe-oriri, we b͕asa. 6 Ìgwè ewu na aturu nkem nākpafu n'ugwu nile, na n'elu ugwu ntà ọ bula di elu: ọ bu kwa n'elu uwa nile ka ìgwè ewu na aturu nkem b͕asara: ọ dighi kwa onye nāju ajuju bayere ha, ọ dighi kwa onye nāchọ ha. 7 N'ihi nka, unu ndi-ọzùzù-aturu, nurunu okwu Jehova: 8 Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), n'ezie n'ihi na ìgwè ewu na aturu nkem ghọrọ ihe-nluta-n'agha, ìgwè ewu na aturu nkem ewe ghọrọ anu nile ihe-oriri, n'ihi na onye-ọzùzù-aturu adighi, na n'ihi na ndi-ọzùzù-aturum achọghi ìgwè ewu na aturu nkem, kama ndi-ọzùzù-aturu nāzù onwe-ha, ma ìgwè ewu na aturu nkem ka ha nāzùghi; 9 n'ihi nka, unu ndi-ọzùzù-aturu, nurunu okwu Jehova; 10 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu onwem nēmegide ndi-ọzùzù-aturu; M'gājuta kwa ìgwè ewu na aturu nkem n'aka-ha, me ka ha kwusi izù ìgwè ewu na aturu ahu; ndi-ọzùzù-aturu agaghi-azù kwa onwe-ha ọzọ; M'gānaputa kwa ìgwè ewu na aturu nkem n'ọnu-ha, ka ha we ghara ighọrọ ha ihe-oriri. 11 N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu, ọbuná Mu onwem, M'gāchọ kwa ìgwè ewu na aturu nkem, chọputa ha. 12 Dika onye-ọzùzù-aturu si achọputa ìgwè aturu-ya, n'ubọchi ọ nọ n'etiti ìgwè ewu na aturu-ya nke b͕asara ab͕asa, otú a ka M'gāchọputa ìgwè ewu na aturu nkem; M'gānaputa kwa ha n'ebe nile ha b͕asara n'ubọchi nke igwe-oji na oké ọchichiri. 13 M'gēme kwa ka ha si na ndi nile di iche iche puta, M'gāchikọputa kwa ha n'ala nile, me ka ha ba n'ala-ha; M'gāzù kwa ha n'ugwu nile nke Israel, na n'akuku ebe nile miri si erù, na n'ebe-obibi nile nke ala-ha. 14 Ezi ihe-ọzùzù-aturu ka M'gēji zù ha, ọ bu kwa n'ugwu nile nke ebe di elu nke Israel ka ebe-ita-nri-ha gādi: n'ebe ahu ka ha gāmakpu n'ezi ebe-ita-nri, ọ bu kwa ihe-ọzùzù-aturu makarisiri nma ka ha gēji zù onwe-ha n'ugwu nile nke Israel. 15 Mu onwem gāzù ìgwè ewu na aturu nkem, Mu onwem gēme kwa ka ha makpue amakpu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 16 Nke furu efu ka M'gāchọ, ọ bu kwa nke achufuru achufu ka M'gēwelata, ọkpukpu ab͕ajiri ab͕aji ka M'gēkezi kwa, nke aru-ya nādighi ike ka M'gēme kwa ka ọ di ike: ma nke mara abuba na nke di ike ka M'gēkpochapu; M'gāzù ha n'ikpé ziri ezi. 17 Ma unu onwe-unu, ìgwè ewu na aturu nkem, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu nēkpe ikpe n'etiti anu na anu, ma ebulu ma nkpi. 18 Ọ̀ bu unu ihe ntà na unu ji ezi ihe-ọzùzù-aturu azù onwe-unu, ma unu gāzọtọ ihe-ọzùzù-aturu-unu fọdurunu n'ukwu-unu? ọ̀ bu kwa unu ihe ntà na ọ bu miri doro edo ka unu nāṅu, ma unu gāb͕aru miri fọdurunu n'ukwu-unu? 19 Ma ìgwè ewu na aturu nkem, ọ bu ihe ukwu-unu zọtọrọ ka ha ji azù onwe-ha, ọ bu kwa miri ukwu-unu b͕aruru ka ha nāṅu. 20 N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, Mu, ọbuná Mu onwem, gēkpe kwa ikpe n'etiti anu mara abuba na anu tara aru. 21 N'ihi na unu ji akuku na ubu-aka enuzuga, na n'ihi na unu ji mpi-unu asọzuga anu nile nāria ọria, rue mb͕e unu chusasiri ha n'èzi; 22 n'ihi nka M'gāzọputa ìgwè ewu na aturu nkem, ha agaghi-aghọ kwa ihe-nluta-n'agha ọzọ; M'gēkpe kwa ikpe n'etiti anu na anu. 23 M'gēme kwa ka otù onye-ọzùzù-aturu biliere ha, ọ gāzù kwa ha, ọbuná orùm, bú Devid; ya onwe-ya gāzù ha, ya onwe-ya gābu-kwa-ra ha onye-ọzùzù-aturu. 24 Mu onwem, bú Jehova, gābu-kwa-ra ha Chineke, orùm, bú Devid, gābu kwa onye-isi n'etiti ha; Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu. 25 Mu na ha gāb͕a kwa ọb͕ub͕a-ndu udo, M'gēme kwa ka ajọ anu-ọhia kwusi n'ala-ha: ha gēbi n'ọzara na ntukwasi-obi, raru ura n'oké ọhia. 26 M'gēme kwa ka ha na ebe nile nke di ugwu ntàm buruburu ghọ ngọzi; M'gēme kwa ka oké miri-ozuzo zo na mb͕e-ya; oké miri-ozuzo nke ngọzi gādi. 27 Osisi ọhia gāmi kwa nkpuru-ya, ala gēme kwa ihe-ọmume-ya, ha gānọ kwa n'elu ala-ha na ntukwasi-obi; ha gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'tijiworo nkpọrọ nile nke yoke-ha, naputa ha n'aka ndi mere ha ka ha fè ha òfùfè. 28 Ha agaghi-abu-kwa-ra mba nile ihe-nluta-n'agha ọzọ, anu-ọhia nke uwa agaghi-eri kwa ha; ma ha gēbi na ntukwasi-obi, ọ dighi kwa onye ganēme ka ha ma jijiji. 29 M'gēme kwa ka ihe-ọkukù nke agāma aha-ya biliere ha, ha agaghi-abu kwa ndi oké unwu kpochapuworo n'ala-ha ọzọ, ha agaghi-ebu kwa ihere mba nile ọzọ. 30 Ha ewe mara na Mu onwem, bú Jehova, bú Chineke-ha, nọyere ha, ha mara kwa na ha onwe-ha bu ndim, bú ulo Israel; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 31 Ma unu onwe-unu, ìgwè ewu na aturu nkem, bú ìgwè ewu na aturu nke ebe-ita-nrim, madu ka unu bu, Mu onwem bu Chineke-unu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

Ezikiel 35

1 Okwu Jehova we ruem nti, si, 2 Nwa nke madu, che iru-gi imegide ugwu Sia, bue amuma megide ya, 3 si ya, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu onwem nēmegide gi, ugwu Sia, M'gēseti kwa akam imegide gi, M'gēme kwa ka i ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu na ihe-iju-anya. 4 Obodo-gi nile ka M'gēme ka ha ghọ nkpọnkpọ ebe, gi onwe-gi gābu kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu; i we mara na Mu onwem bu Jehova. 5 N'ihi na i nwere iro ebighi-ebi, we rara umu Israel nye n'aka mma-agha na mb͕e nhuju-anya-ha, na mb͕e nke ajọ omume nke mb͕e ikpe-azu: 6 n'ihi nka, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), n'ezie nání ọbara ka M'gēme gi ka i ghọ, ọbara ganāchu kwa gi: ọ bu ezie na i kpọghi ọbara asì, ma ọbara gāchu gi. 7 M'gēme kwa ugwu Sia ka ọ ghọ ihe-iju-anya na ebe tọb͕ọrọ n'efu; M'gēbipu kwa nime ya onye nāgabiga na onye nālaghachi. 8 M'gēmeju kwa ugwu-ya nile na ndi-ya eb͕uru eb͕u: ugwu ntà gi nile na ndagwurugwu-gi nile na ebe-gi nile miri si erù, ndi ejiri mma-agha b͕u gāda nime ha. 9 Ebe nke tọb͕ọrọ n'efu mb͕e ebighi-ebi ka M'gēme gi ka i ghọ, madu agaghi-ebi kwa n'obodo-gi nile: unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova. 10 N'ihi na i siwo, Mba abua ndia na ala abua ndia gābu nkem, ayi gēnweta kwa ya; ma Jehova nọrọ n'ebe ahu: 11 n'ihi nka, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), M'gēme kwa dika iwe-gi si di, na dika ekworo-gi si di nke i kwoworo site n'asì i kpọrọ ha; Mgēme kwa ka amara Mu onwem n'etiti ha, mb͕e M'gēkpe gi ikpe. 12 I gāma kwa na Mu onwem, bú Jehova, anuwo okwu-nlelì-gi nile nke i kwuworo megide ugwu nile nke Israel, si, Ha bu ebe tọb͕ọrọ n'efu, ayi ka ewereworo ha nye ka ayi we ripia ha. 13 Unu we were ọnu-unu me onwe-unu ka unu di uku imegidem, me ka okwu-unu ba uba imegidem: Mu onwem anuwo. 14 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: ka ọṅù nke uwa nka nile ra, otú a ka M'gēme gi ka i ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu. 15 Dika i ṅuriri ọṅu n'isi ihe-nketa nke ulo Israel, n'ihi na ọ tọb͕ọrọ n'efu, otú a ka M'gēme gi: ebe tọb͕ọrọ n'efu ka i gābu, gi ugwu Sia, na Edom nile, ọbuná Edom nile: ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

Ezikiel 36

1 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, buere ugwu nile nke Israel amuma, si, Unu ugwu Israel, nurunu okwu Jehova. 2 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na onye-iro asiwo megide unu, Ehe! na, Ebe di elu nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga aghọworo ayi ihe-nnweta: 3 n'ihi nka bue amuma, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na, ọbuná n'ihi na ha emewo ka unu tọb͕ọrọ n'efu, na n'ihi na ha eledawo unu buruburu, ka unu we ghọrọ mba nile fọdurunu ihe-nnweta, ewe me ka unu rigokwasi n'eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi-ire, buru akukọ ọjọ nke ndi-unu: 4 n'ihi nka, unu ugwu Israel, nurunu okwu nke Onye-nwe-ayi Jehova; Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri ugwu nile na ugwu ntà nile na ebe nile miri si erù na ndagwurugwu nile na nkpọnkpọ ebe nile nke tọb͕ọrọ n'efu na obodo nile anapuru anapu, nke ghọwo-kwa-ra mba nile fọdurunu nke di buruburu ihe-nluta-n'agha na ihe-ikwa-emò: 5 n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: N'ezie n'ọku nke ekworom ka M'kwuworo okwu megide mba nile fọduru, megide kwa Edom nile, ndi wereworo alam nye onwe-ha ibu ihe-nnweta n'ọṅù nke obi-ha nile, nime nlelì nke nkpuru-obi-ha, ka ha we chupu ya ka ọ ghọ ihe-nluta-n'agha: 6 n'ihi nka bue amuma bayere ala Israel, si ugwu-ya nile, si kwa ugwu ntà ya nile, si ebe-ya nile miri si erù, si kwa ndagwurugwu-ya nile, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Lem anya, n'ekworom na n'ọnumam ka M'kwuworo okwu, n'ihi na ọ bu ọnọdu-ihere nke mba di iche iche ka unu būruworo: 7 n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Mu onwem eweliwo akam elu, si, N'ezie mba nile ndi di unu buruburu, ha onwe-ha gēbu ọnọdu-ihere-ha. 8 Ma unu onwe-unu, ugwu Israel, ngalaba-unu ka unu gāwaputa, miara ndim, bú Israel, nkpuru-unu; n'ihi na ha nọ nso ibia. 9 N'ihi na, le, Mu onwem diri unu, M'gēche kwa unu iru, agālu kwa unu dika ubi, gha unu ihe: 10 M'gēme kwa ka madu ba uba n'elu unu, bú ulo Israel nile, ha nile: madu gēbi kwa n'obodo-unu nile, ọ bu kwa nkpọnkpọ ebe nile unu ka agēwu: 11 M'gēme kwa ka madu na anumanu ba uba n'elu unu; ha gāba kwa uba, mua ọmùmù: M'gēme kwa ka madu bi nime unu dika ọnọdu mb͕e ochie unu si di, M'gēme kwa unu nma karia na mb͕e mbu unu: unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova. 12 M'gēme kwa ka madu jegharia n'elu unu, ọbuná ndim, bú Israel; ha gēnweta kwa gi, i gāghọ-kwa-ra ha ihe-nketa, i gaghi-ab͕aba kwa ha aka umu ọzọ ma-ọli. 13 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na ha nāsi unu, Ala nke nēri madu ka i bu, ala nke nāb͕aba mba-gi aka umu ka i buworo; 14 n'ihi nka i gaghi-eri kwa madu ọzọ, i gaghi-ab͕aba kwa mba-gi aka umu ọzọ, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta); 15 M'gaghi-eme kwa ka i nuru ọnọdu-ihere mba nile ọzọ, i gaghi-ebu kwa ita-uta nke ndi nile di iche iche ọzọ, i gaghi-eme kwa ka mba-gi su ngọngọ ọzọ; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 16 Okwu Jehova we ruem nti, si, 17 Nwa nke madu, mb͕e ulo Israel bi n'elu ala-ha, ha we merua ya site n'uzọ-ha, site kwa n'omume nile ha: dika iru-árú nke nwanyi di na nsọ, otú a ka uzọ-ha diri n'irum. 18 M'we wukwasi ha ọnumam n'ihi ọbara ahu nke ha wukwasiri n'ala-ha, na n'ihi na ha jiri arusi nile ha merua ya: 19 M'we chusa ha n'etiti mba nile, ha we b͕asa n'ala nile: dika uzọ-ha si di, na dika omume nile ha si di, otú a ka M'kpere ha ikpe. 20 Ha we biarue mba nile ebe ha biara, ha we me ka aha nsọm ghara idi nsọ; mb͕e anēkwu okwu bayere ha, si, Ndi nke Jehova ka ndia bu, ọ bu kwa n'ala-Ya ka ha siri puta. 21 Ma enwerem ọmiko n'aru aha nsọm, nke ulo Israel mereri ka ọ ghara idi nsọ n'etiti mba nile, ebe ha biara. 22 N'ihi nka si ulo Israel, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ bughi n'ihi unu ka Mu onwem nālu ọlu, unu ulo Israel, kama ọ bu n'ihi aha nsọm, nke unu meworo ka ọ ghara idi nsọ n'etiti mba nile ebe unu biara. 23 M'gēdo kwa aha ukum nsọ, nke emere ka ọ ghara idi nsọ n'etiti mba nile, nke unu meworo ka ọ ghara idi nsọ n'etiti ha; mba nile gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), mb͕e agēdom nsọ nime unu n'anya-ha. 24 M'gēweputa kwa unu n'etiti mba nile, chikọputa kwa unu n'ala nile, me ka unu bata n'ala-unu. 25 M'gāwusa kwa unu miri di ọcha, unu ewe di ọcha: ọ bu iru-árú nile unu na arusi nile unu ka M'gēme unu ka unu si nime ha di ọcha. 26 M'gēnye kwa unu obi ọhu, ọ bu kwa mọ ọhu ka M'gētiye nime unu: M'gēwezuga kwa obi nkume n'anu-aru-unu, nye unu obi nke bu anu-aru. 27 Mọ nkem ka M'gētiye nime unu, me ka ọ buru n'ukpurum nile ka unu gējeghari, ọ bu kwa ikpém nile ka unu gēdebe, me ha. 28 Unu gēbi kwa n'ala ahu nke M'nyere nna-unu-hà; unu gābu-kwa-ram otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra unu Chineke. 29 M'gāzọputa kwa unu n'iru-árú nile unu: M'gākpọ kwa ọka, me ka ọ ba uba, M'gaghi-atukwasi unu oké unwu. 30 M'gēme kwa ka nkpuru osisi na ihe-omume nke ubi ba uba, ka unu we ghara inara kwa ita-uta nke oké unwu n'etiti mba nile ọzọ. 31 Unu gēcheta kwa uzọ ọjọ nile unu, na omume nile unu nke nādighi nma; unu gāsọ kwa onwe-unu oyi n'anya-unu n'ihi ajọ omume nile unu na n'ihi ihe-árú nile unu. 32 Ọ bughi n'ihi unu ka Mu onwem nālu ọlu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), maranu nka: ka ihere uzọ nile unu me unu, ka etiye kwa unu n'ọnọdu-ihere, unu ulo Israel. 33 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ubọchi M'mere ka unu si n'ajọ omume nile unu di ọcha, n'ubọchi ahu ka M'gēme ka madu bi n'obodo nile unu, agēwu kwa ebe nile tọb͕ọrọ n'efu. 34 Ala-ubi ahu nke tọb͕ọrọ n'efu ka agālu kwa, n'ọnọdu ibu ebe tọb͕ọrọ n'efu n'anya onye ọ bula nāgabiga. 35 Ha gāsi kwa, Ala nka nke tọb͕ọrọ n'efu aghọwo ubi dika ubi Iden ab͕ara ogige; ọzọ, obodo nile nke bu nkpọnkpọ, nke tọb͕ọrọ n'efu, nke akwaturu n'ala, ha aghọwo ebe ewusiri ike nke madu bi nime ha. 36 Mba nile nke fọduru n'ala di unu buruburu gāma kwa na Mu onwem, bú Jehova, ewuwo ebe nile akwaturu akwatu, ku kwa ubi nke tọb͕ọrọ n'efu: Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu, M'gēme kwa ya. 37 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọzọ, nka ka M'gēkwe ka ulo Israel juam ase bayere ya, ka M'we mere ha ya; M'gēme ka ha ba uba na madu dika ìgwè ewu na aturu. 38 Dika ìgwè ewu na aturu di nsọ, dika ìgwè ewu na aturu nke Jerusalem na mb͕e-ya nile akara àkà; otú a ka nkpọnkpọ obodo nile gējuputa na ìgwè ewu na aturu nke bu madu: ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

Ezikiel 37

1 Aka Jehova we dikwasim, O we me ka m'pua apu nime Mọ nke Jehova, O we dọbam n'etiti ndagwurugwu ahu; ma ndagwurugwu ahu juputara n'ọkpukpu; 2 O we me ka m'gabiga n'akuku ha buruburu n'akuku nile: ma, le, ha bara uba nke-uku n'elu ndagwurugwu; ma, le, ha kpọrọ nku nke-uku. 3 O we sim, Nwa nke madu, Ọkpukpu ndia, hà gādi ndu? M'we si, Onye-nwe-ayi Jehova, Gi onwe-gi mara. 4 O we sim, Bue amuma n'elu ọkpukpu ndia, si ha, Unu ọkpukpu kpọrọ nku, nurunu okwu Jehova. 5 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri ọkpukpu ndia: Le, Mu onwem gaje ime ka ume ba nime unu, unu ewe di ndu. 6 M'gētiyekwasi kwa unu akwara, me ka anu-aru rigokwasi unu, M'gēkpuchi kwa unu akpukpọ-aru, tiye ume nime unu, unu ewe di ndu, we mara na Mu onwem bu Jehova. 7 M'we bue amuma dika esiri nyem iwu: otù olu we da mb͕e m'nēbu amuma, ma, le, ime-nkpatu di, ọkpukpu we biarute onwe-ha nso, ọkpukpu n'ọkpukpu nke ya. 8 M'we hu, ma, le, akwara dikwasi ha, anu-aru rigota-kwa-ra, akpukpọ-aru we kpuchie ha n'elu: ma ume adighi nime ha. 9 O we sim, Buere ifufe amuma, bue amuma, nwa nke madu, si ifufe, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Si n'ifufe anọ bia, gi ume, kukwasi ndia eb͕uru eb͕u ume, ka ha we di ndu. 10 M'we bue amuma dika O nyerem iwu, ume we ba nime ha, ha we di ndu, guzo ọtọ n'ukwu-ha, buru oké usu-ndi-agha di uku ri nne. 11 O we sim, Nwa nke madu, ọkpukpu ndia, ulo Israel nile ka ha bu: le, ha nāsi, Ọkpukpu-ayi akpọwo nku, olile-anya-ayi alawo kwa n'iyì; ebipusiwo ayi onwe-ayi. 12 N'ihi nka bue amuma, si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu onwem gēmeghe ílì nile unu, me ka unu si n'ílì-unu rigoputa, unu ndim; M'gēme kwa ka unu bata n'ala Israel. 13 Unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'meghesiri ílì-unu, na mb͕e M'mesiri ka unu si n'ílì-unu rigoputa, unu ndim. 14 M'gētiye kwa Mọm nime unu, unu ewe di ndu, M'gēme kwa ka unu nọdu n'ala-unu: unu ewe mara na Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo, me ya; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 15 Okwu Jehova we ruem nti, si, 16 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, were otù osisi n'onwe-gi, de n'elu ya, Nke Juda, na nke umu Israel ndi ekekọtaworo ya na ha n'otù: were kwa osisi ọzọ, de n'elu ya, Nke Josef, osisi Efraim, na nke ulo Israel nile ndi ekekọtaworo ya na ha n'otù: 17 gi jikọta kwa ha, otù na ibe-ya, nye onwe-gi, ka ha ghọ otù osisi, ka ha we ghọ otù n'aka-gi. 18 Ma mb͕e umu ndi-gi gāgwa gi okwu, si, Ì gaghi-egosi ayi ihe ihe ndia bu n'ebe i nọ? 19 gwa ha okwu, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu onwem gaje iwere osisi Josef nke di n'aka Efraim, na ebo nile nke Israel ndi ekekọtaworo ya na ha n'otù; M'gētiyekọ kwa ha na ya, bú osisi Juda, me ka ha ghọ otù osisi, ha ewe ghọ otù n'akam. 20 Osisi abua ahu nke i nēde ihe n'elu ha gādi kwa n'aka-gi n'anya-ha. 21 Gwa kwa ha okwu, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu onwem ganāchiputa umu Israel n'etiti mba nile, ebe ha jere, M'gāchikọputa kwa ha n'akuku nile, me ka ha bata n'ala-ha: 22 M'gēme kwa ha otù mba n'ala-ha, n'ugwu nile nke Israel; otù eze gābu-kwa-ra ha nile eze: ha agaghi-abu kwa mba abua ọzọ, agaghi-ekera kwa ha ala-eze abua ọzọ ma-ọli: 23 ha agaghi-eji kwa arusi nile ha, ma-ọbu ihe-árú nile ha, ma-ọbu njehie nile ha, meru onwe-ha ọzọ: kama M'gāzọputa ha n'ebe-obibi nile ha, ebe ha mehieworo, M'gēme kwa ka ha di ọcha: ha ewe ghọrọm otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra ha Chineke. 24 Orùm, bú Devid, gābu kwa eze-ha; ọ bu kwa otù onye-ọzùzù-aturu ka ha nile gēnwe: ọ bu kwa n'ikpém nile ka ha gējeghari, ukpurum nile ka ha gēdebe kwa, me ha. 25 Ha gēbi kwa n'ala ahu nke M'nyeworo orùm, bú Jekob, nke nna-unu-hà biri nime ya; ha gēbi kwa nime ya, ha onwe-ha, na umu-ha, na umu umu-ha, rue mb͕e ebighi-ebi: Devid, bú orùm, gābu-kwa-ra ha onye-isi rue mb͕e ebighi-ebi. 26 Mu na ha gāb͕a kwa ọb͕ub͕a-ndu udo: ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ka ọ gābu n'ebe ha nọ: M'gēdo kwa ha, me ka ha ba uba, M'gētiye kwa ebe nsọm n'etiti ha rue mb͕e ebighi-ebi. 27 Ebe-obibim gādi kwa n'elu ha, M'gābu-kwa-ra ha Chineke, ha onwe-ha gābu-kwa-ram otù ndi. 28 Mba nile gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, Onye nēdo Israel nsọ, mb͕e ebe nsọm gādi n'etiti ha rue mb͕e ebighi-ebi.

Ezikiel 38

1 Okwu Jehova we ruem nti, si, 2 Nwa nke madu, che iru-gi na Gog, nke ala Megog, bú onye-isi nke Rosh na nke Meshek na nke Tubal, bue amuma megide ya, 3 si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu onwem nēmegide gi, Gog, onye-isi nke Rosh na nke Meshek na nke Tubal: 4 M'gēchighari gi, tiye nb͕a-aka-imi n'àb͕à-gi abua, me ka i puta, gi na usu-ndi-agha-gi nile, ma inyinya ma ndi-inyinya, ndi yiri uwe mab͕uru onwe-ya, ha nile, ọ bu nkpọkọta madu bara uba chiri ọta uku na ọta, ndi nējide mma-agha, ha nile: 5 Peasia na Etiopia na Put soro ha; ha nile chiri ọta na okpu-agha: 6 Goma na usu-ndi-agha-ya nile; ulo Togama nke akuku Ugwu dikarisiri anya, na usu-ndi-agha-ya nile: ọbuná ọtutu ndi di iche iche so gi. 7 Buru onye jikere, e, jikere onwe-gi, gi onwe-gi, na nkpọkọta ndi-gi nile, ndi akpọkọtaworo n'ebe i nọ, gi buru ha ọchi-agha. 8 Mb͕e ọtutu ubọchi gasiri agēleta gi: n'ikpe-azu nke arọ ndia ka i gābà n'ala nke emeworo ka o si na mma-agha lata, nke achikọputaworo n'ọtutu ndi di iche iche, n'elu ugwu nile nke Israel, nke ghọworo nkpọnkpọ ebe mb͕e nile: ma emewo ala ahu ka o si n'etiti ndi di iche iche puta, ha gēbi kwa na ntukwasi-obi, ha nile. 9 I gārigo kwa, dika ikuku siri ike ka i gābia, dika igwe-oji ikpuchi ala ka i gādi, gi onwe-gi, na usu-ndi-agha-gi nile, na ọtutu ndi di iche iche so gi. 10 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ gēru kwa n'ubọchi ahu, na ihe di iche iche gābata n'obi-gi, i gēchè kwa èchìchè ọjọ: 11 i gāsi kwa, M'gārigo imegide ala bu nání obodo nēnweghi mb͕idi; m'gābakwasi ndi nọ jū, ndi nọ na ntukwasi-obi, ha nile bi n'ebe nēnweghi mb͕idi, ọ dighi kwa ihe-ntuchi ma-ọbu ibo-ọnu-uzọ ha nwere: 12 ikwata ihe-nkwata na iluta ihe-nluta n'agha; ichighari aka-gi imegide nkpọnkpọ ebe nke madu bi nime ha ub͕u a, na imegide otù ndi nke achikọputaworo na mba di iche iche, nke lutaworo anu-ulo na ihe-ahia n'ọlu, ndi bi n'elu-ala nke uwa. 13 Sheba na Dedan na ndi-ahia Tashish na umu-ọdum-ya nile gāsi gi, Ọ̀ bu ikwata ihe-nkwata ka gi onwe-gi nābia? ọ̀ bu iluta ihe-nluta n'agha ka i kpọkọtaworo nkpọkọta ndi-gi? ọ̀ bu ibupu ọla-ọcha na ọla-edo, ichipu anu-ulo na ihe-ahia, ikwata oké ihe-nkwata? 14 N'ihi nka bue amuma, nwa nke madu, si Gog, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ̀ bughi n'ubọchi ahu mb͕e ndim, bú Israel, bi na ntukwasi-obi ka i gāmara ya? 15 I gēsi kwa n'ebe-gi, n'akuku nile nke Ugwu dikarisiri anya, bia, gi onwe-gi, na ọtutu ndi di iche iche so gi, ndi nānọkwasi inyinya ka ha nile bu, ha bu nkpọkọta madu di uku na usu-ndi-agha bara uba: 16 i gārigo kwa imegide ndim, bú Israel, dika igwe-oji ikpuchi ala; n'ikpe-azu nke ubọchi ndia ka ọ gēru, na M'gēme ka i biakwasi alam, ka mba nile we maram, mb͕e agēdowomri nsọ nime gi n'anya-ha, gi Gog. 17 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ̀ bu gi onwe-gi bu onye ahu nke M'kwuru okwu bayere ya na mb͕e ochie site n'aka ndi-orùm, bú ndi-amuma Israel, ndi nēbu amuma n'ubọchi ahu ọtutu arọ, si, na M'gēme ka i biakwasi ha? 18 Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, n'ubọchi Gog nābia imegide ala Israel, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), na ọnumam gārigota n'imim. 19 Ọ bu kwa n'ekworom n'ọku nke nrubiga-ókè nke iwem ka M'kwuworo, si, N'ezie n'ubọchi ahu ime-nkpatu uku gādi n'elu ala Israel; 20 azù nile nke oké osimiri, na anu-ufe nke elu-igwe, na anu ọhia, na ihe nile nke nākpu akpu, bú nke nākpu akpu n'ala, na madu nile ndi nọ n'elu uwa, ewe me nkpatu site n'irum, agākwatu kwa ugwu nile, ebe nile di nkputankpu gāda kwa, mb͕idi nile ọ bula gādaru kwa ala. 21 M'gākpọ kwa mma-agha ka ọ dakwasi ya n'ugwum nile, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta): mma-agha onye ọ bula ganēmegide nwa-nne-ya. 22 Mu na ya gēkpe kwa ikpe n'ajọ ọria nēfe efe na n'ọbara; ọ bu kwa oké miri-ozuzo nēzobiga ókè, na oké ákú-miri-ígwé, na ọku, na brimstone, ka M'gēme ka ha zokwasi ya, zokwasi kwa usu nile nke ndi-agha-ya, zokwasi kwa ọtutu ndi di iche iche so ya. 23 M'gēme kwa Onwem ka M'di uku, M'gēdo kwa Onwem nsọ, me ka amara Mu onwem n'anya ọtutu mba; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

Ezikiel 39

1 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, bue amuma megide Gog, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu onwem nēmegide gi, Gog, onye-isi nke Rosh na nke Meshek na nke Tubal: 2 M'gēchighari kwa gi, duru gi, me ka i si n'akuku nile dikarisiri anya nke Ugwu rigota; M'gēme kwa ka i bia n'elu ugwu nile nke Israel: 3 M'gētipu kwa uta-gi n'aka-ekpe-gi, me ka àkú-gi nile dapu n'aka-nri-gi. 4 N'elu ugwu nile nke Israel ka i gāda, gi onwe-gi, na usu-ndi-agha-gi nile, na ndi di iche iche ndi nēso gi: udele nile di iche iche na anu ọhia ka M'gēwere gi nye, ka ha we rie gi. 5 N'ọhia ka i gāda: n'ihi na Mu onwem ekwuwo, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 6 M'gēziga ọku n'aru Megog na n'aru ndi bi n'agwe-etiti nile na ntukwasi-obi: ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova. 7 Aha nsọm ka M'gēme kwa ka amara ya n'etiti ndim, bú Israel; M'gaghi-ekwe kwa ọzọ ka eme ka aha nsọm ghara idi nsọ: mba nile ewe mara na Mu onwem bu Jehova, Onye nsọ nọ n'Israel. 8 Le, ọ nābia, ọ gēme kwa, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta); nka bu ubọchi ahu nke M'kwuworo okwu bayere ya. 9 Ndi bi n'obodo nile nke Israel gāpu kwa, chiri ihe-agha funwue ọku sure ha, ma ọta ma ọta uku, ma uta ma àkú, ma nkpa-n'aka, ma ube, ha gāchiri ha funwue ọku arọ asa: 10 ha ewe ghara ikpata nkú n'ọhia, ha agaghi-eb͕utu kwa nkú n'oké ọhia; n'ihi na ha gāchiri ihe-agha funwue ọku: ha gākwata kwa ndi-nkwata-ha, luta kwa ndi-nluta-ha n'agha; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 11 O gēru kwa n'ubọchi ahu, na M'gēnye Gog otù ebe ílì ozu n'Israel, bú ndagwurugwu nke ndi-ngabiga n'akuku Iru-anyanwu nke oké osimiri: ihe nēb͕ochibido ndi-ngabiga ka ọ gābu: ha gēlì kwa n'ebe ahu Gog na ìgwè ndi-ya nile: ha ewe kpọ ya, Ndagwurugwu Hamon-Gog. 12 Ma ọnwa asa ka ulo Israel gānọ nēlì ha, ka ha we me ka ala-ha di ọcha. 13 E, ndi nile nke ala ahu gēli ha; ọ gāghọ-kwa-ra ha aha, n'ubọchi agāsọpurum; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 14 Ọ bu kwa ndi ganalu ọlu mb͕e nile ka ha gēkewaputa, ndi ganāgabiga n'ala-ha nēlì ndi-ngabiga ahu, bú ndi fọduru n'elu ala, ime ka ọ di ọcha: n'ọgwugwu ọnwa asa ka ha gāchọputa. 15 Ma ndi nāgabiga n'ala gāgabiga; mb͕e onye ọ bula gāhu ọkpukpu madu, ọ gēwu kwa ihe-iriba-ama n'akuku ya, rue mb͕e ndi nēlì ozu gēlìwo ya-ri na ndagwurugwu Hamon-Gog. 16 Ọzọ kwa, aha nke otù obodo gābu Hamona. Ha ewe me ka ala ahu di ọcha. 17 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Si nnunu nile di iche iche, si kwa anu ọhia nile ọ bula, Chikọtanu onwe-unu, bia; zukọputanu n'akuku nile di buruburu, n'ihi àjàm nke Mu onwem nāchuru unu, bú àjà di uku M'nāchu n'elu ugwu nile nke Israel, ka unu we rie anu, ṅu kwa ọbara. 18 Anu-aru ndi-dike ka unu gēri, ọ bu kwa ọbara ndi-isi nke uwa ka unu gāṅu, nke ebulu, na nke umu-aturu, na nke ewu, na nke oké-ehi, anu gbara abuba nke Beshan ka ha nile bu. 19 Unu gēriju kwa abuba afọ, ṅubiga ọbara ókè, bú nke sitere n'àjàm nke M'churu n'ihi unu. 20 Afọ inyinya na ub͕ọ-ala na ndi-dike na ndi-agha nile gēju unu table nkem; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 21 M'gēdo kwa nsọpurum n'etiti mba nile, mba nile gāhu kwa ihe M'kpere n'ikpe nke M'meworo, na akam nke M'tukwasiworo ha. 22 Ulo Israel ewe mara na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-ha, site n'ubọchi ahu we ga n'iru. 23 Mba nile gāma kwa na ọ bu n'ihi ajọ omume-ha ka emere ka ulo Israel je biri n'ala ọzọ; n'ihi na ha mekpuru emekpu megidem, M'we zonari ha irum: M'we nye ha n'aka ndi nākpab͕u ha, ha we site na mma-agha, ha nile. 24 Dika iru-árú-ha si di na dika njehie nile ha si di, otú a ka M'mere ha: M'we zonari ha irum. 25 N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Ub͕u a ka M'gēme ka ndi Jekob adọtara n'agha lata, M'gēnwe kwa obi-ebere n'aru ulo Israel nile; M'gēkwo-kwa-ra aha nsọm ekworo. 26 Ha gēbu kwa ihere-ha, na nmekpu nile ha nke ha mekpuworo megidem, mb͕e ha gēbi n'ala-ha na ntukwasi-obi, mb͕e ọ gaghi-adi onye ọ bula nēme ka ha ma jijiji; 27 mb͕e M'gēmewori ka ha si n'etiti ndi nile di iche iche lata, mb͕e M'gāchikọputawo ha-ri n'ala nile nke ndi-iro-ha, ewe dom nsọ nime ha n'anya ọtutu mba. 28 Ha gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-ha, ebe M'mere ka ha je biri n'ala ọzọ n'etiti mba nile, M'we chikọba ha n'ala-ha; M'gaghi-eme kwa ka onye ọ bula nime ha fọdu n'ebe ahu ọzọ; 29 M'gaghi-ezonari kwa ha irum ọzọ: n'ihi na awukwasiwom Mọm n'ulo Israel; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

Ezikiel 40

1 N'arọ nke-orú-na-ise nke emere ka ayi je biri n'ala ọzọ, n'isi-nmalite arọ ahu, n'ubọchi nke-isi nke ọnwa, n'arọ nke-iri-na-anọ site na mb͕e etikpọsiri obodo-ayi, n'otù ubọchi ahu, aka Jehova dim n'aru, O we me ka m'bia n'ebe ahu. 2 N'ọhù di iche iche nke Chineke ka O mere ka m'bata n'ala Israel, Ọ dọbam n'ugwu di elu nke-uku, nke ihe dika obodo anēwu ewu di n'elu ya n'akuku Ndida. 3 O we me ka m'bia n'ebe ahu, ma le, otù nwoke, ma ele ya anya ọ di ka ọla si di n'ile ya anya, eriri flax di kwa n'aka-ya, ya na amì eji atù ihe; onye ahu nēguzo kwa n'ọnu-uzọ-ama. 4 Nwoke ahu we gwam okwu, si, Nwa nke madu, were anya-gi abua hu, were kwa nti-gi abua nu, tukwasi kwa obi-gi n'ihe nile Mu onwem nēme ka i hu; n'ihi na ọ bu ime ka i hu ha ka emeworo ka i bia ebe a: gosi ulo Israel ihe nile nke gi onwe-gi nāhu. 5 Ma le, otù mb͕idi di n'èzí ulo ahu buruburu n'akuku nile, n'aka nwoke ahu ka amì eji atù ihe di kwa nke di cubit isi n'ogologo, cubit ọ bula bu otù cubit na otù ntù-ọbu-aka: o we tùa ib͕idi nke mb͕idi ahu anēwu ewu, otù ami; na idi-elu-ya, otù ami. 6 O we biarue ọnu-uzọ-ama nke nēche iru n'uzọ Iru-anyanwu, ọ rigo ihe-nrigo-ya, tùa nbata-uzọ nke ọnu-uzọ-ama ahu, otù ami n'obosara: ọbuná otù nbata-uzọ, otù ami n'obosara. 7 Ime-ulo ọ bula bu otù ami n'ogologo, na otù ami n'obosara; n'etiti ime-ulo abua di cubit ise; nbata-uzọ nke ọnu-uzọ-ama n'akuku uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama chere iru n'ulo bu otù ami. 8 O we tùa uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama chere iru n'ulo, otù ami. 9 O we tùa uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama, cubit asatọ; na akuku-ọnu-uzọ-ya abua, cubit abua; uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama chere iru n'ulo. 10 Ime-ulo nke ọnu-uzọ-ama n'uzọ Iru-anyanwu di atọ n'otù akuku, atọ n'akuku nke-ọzọ; otù ọtùtù ka ha atọ nwere: ọ bu kwa otù ọtùtù ka akuku-ọnu-uzọ abua nwere n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ. 11 O we tùa obosara nke oghere ọnu-uzọ-ama, cubit iri; na ogologo nke ọnu-uzọ-ama, cubit iri-na-atọ; 12 na ókè-ala n'iru ime-ulo nile, otù cubit n'otù akuku, na ókè-ala, otù cubit n'akuku nke-ọzọ; na ime-ulo onwe-ya, cubit isi n'otù akuku na cubit isi n'akuku nke-ọzọ. 13 O we tùa ọnu-uzọ-ama site n'elu-ulo nke otù ime-ulo rue elu-ulo nke ime-ulo-ibe-ya, obosara-ya di orù cubit na ise; oghere na ncherita-iru oghere. 14 O we me akuku-ọnu-uzọ, ọgu cubit atọ; ọbuná rue akuku-ọnu-uzọ nke ogige, ọnu-uzọ-ama di buruburu n'akuku nile. 15 Ọzọ, site n'iru ọnu-uzọ-ama, na nbata, rue iru uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama di nime di ọgu cubit abua na iri. 16 Ọzọ, window emechiri emechi diri ime-ulo nile, di-kwa-ra akuku-ọnu-uzọ nile ha n'ime ọnu-uzọ-ama buruburu n'akuku nile, otú a ka window di-kwa-ra ulo-nbata nile: window di kwa n'ime ulo buruburu n'akuku nile: nkwu di kwa n'akuku-ọnu-uzọ ọ bula. 17 O we me ka m'bata n'ogige di n'èzí, ma, le, ime-ulo di iche iche na pavement di, nke emeworo nye ogige ahu buruburu n'akuku nile: orú ime-ulo na iri di na pavement ahu. 18 Pavement ahu di kwa n'akuku ọnu-uzọ-ama nile, na nso ogologo nke ọnu-uzọ-ama, bú pavement nke dikari ala. 19 O we tùa obosara-ya site n'iru ọnu-uzọ-ama ahu nke dikari ala rue iru nke ogige di nime n'èzí, ọgu cubit ise, n'akuku Iru-anyanwu na n'akuku Ugwu. 20 Ọnu-uzọ-ama ahu kwa nke nēche iru n'uzọ Ugwu, bú ọnu-uzọ-ama nke ogige di n'èzí, o tùru ogologo-ya na obosara-ya. 21 Ime-ulo-ya di atọ n'otù akuku, atọ n'akuku nke-ọzọ; akuku-ọnu-uzọ-ya abua na ulo-nbata-ya nile di ka ọtùtù nke ọnu-uzọ-ama mbu: ọgu cubit abua na iri ka ogologo-ya di, obosara-ya di kwa orú cubit na ise. 22 Window-ya nile na ulo-nbata-ya nile na nkwu-ya nile di kwa ka ọtùtù nke ọnu-uzọ-ama ahu nke nēche iru n'uzọ Iru-anyanwu; ọ bu kwa ihe-nrigo nke nwere nzọ-ukwu asa ka ha ji arigo nime ya; ulo-nbata-ya nile di kwa n'iru ha. 23 Otù ọnu-uzọ-ama di-kwa-ra ogige di nime na ncherita-iru ọnu-uzọ-ama ọzọ, n'akuku Ugwu na n'akuku Iru-anyanwu; o we tùa site n'otù ọnu-uzọ-ama rue ọnu-uzọ-ama ọzọ, ọgu cubit ise. 24 O we me ka m'je n'uzọ Ndida, ma le, otù ọnu-uzọ-ama di n'uzọ Ndida: o we tùa akuku-ọnu-uzọ-ya abua na ulo-nbata-ya nile dika ọtùtù ndia si di. 25 Window di-kwa-ra ya, di-kwa-ra ulo-nbata-ya nile buruburu n'akuku nile, dika window ndia: ọgu cubit abua na iri ka ogologo-ya di, obosara-ya di kwa orú cubit na ise. 26 Ihe-nrigo nke nwere nzọ-ukwu asa di kwa iji arigo ya, ulo-nbata-ya nile di kwa n'iru ha: o nwe-kwa-ra nkwu, otù n'otù akuku, otù n'akuku nke-ọzọ, n'akuku-ọnu-uzọ-ya abua. 27 Otù ọnu-uzọ-ama di-kwa-ra ogige di nime n'uzọ Ndida: o we tùa site n'otù ọnu-uzọ-ama rue ọnu-uzọ-ama ọzọ n'uzọ Ndida, ọgu cubit ise. 28 O we me ka m'si n'ọnu-uzọ-ama nke Ndida ba n'ogige di nime: o we tùa ọnu-uzọ-ama nke Ndida dika ọtùtù ndia si di; 29 na ime-ulo-ya nile, na akuku-ọnu-uzọ-ya abua, na ulo-nbata-ya nile, dika ọtùtù ndia si di: window di-kwa-ra ya, di-kwa-ra ulo-nbata-ya nile buruburu n'akuku nile: ọgu cubit abua na iri ka ogologo-ya di, obosara-ya di kwa orú cubit na ise. 30 Ulo-nbata di kwa ya buruburu n'akuku nile, ogologo-ha di orú cubit na ise, obosara-ha di kwa cubit ise 31 Ulo-nbata-ya nile chere iru n'ogige di n'èzí; nkwu di kwa n'akuku-ọnu-uzọ-ya abua: nzọ-ukwu asatọ iji arigo ka ihe-nrigo-ya nwere. 32 O we me ka m'bata n'ogige di nime n'uzọ Iru-anyanwu: o we tùa ọnu-uzọ-ama ahu dika ọtùtù ndia si di: 33 na ime-ulo-ya nile, na akuku-ọnu-uzọ-ya abua, na ulo-nbata-ya nile, dika ọtùtù ndia si di: window di-kwa-ra ya, di-kwa-ra ulo-nbata-ya nile buruburu n'akuku nile: ogologo-ya di ọgu cubit abua na iri, obosara-ya di kwa orú cubit na ise. 34 Ulo-nbata-ya nile che-kwa-ra iru n'ogige di n'èzí; nkwu di kwa n'akuku-ọnu-uzọ-ya abua, n'otù akuku na n'akuku ọzọ: ọ bu kwa nzọ-ukwu asatọ iji arigo ka ihe-nrigo-ya nwere. 35 O we me ka m'biarue ọnu-uzọ-ama nke Ugwu, o we tùa ya dika ọtùtù ndia si di; 36 ime-ulo-ya nile, na akuku-ọnu-uzọ-ya abua, na ulo-nbata-ya nile; window di-kwa-ra ya buruburu n'akuku nile: ogologo-ya di ọgu cubit abua na iri, obosara-ya di kwa orú cubit na ise. 37 Akuku-ọnu-uzọ-ya abua chere iru n'ogige di n'èzí; nkwu di kwa n'akuku-ọnu-uzọ-ya abua, n'otù akuku, na n'akuku ọzọ: ọ bu kwa nzọ-ukwu asatọ iji arigo ka ihe-nrigo nwere. 38 Otù ime-ulo na ọnu-uzọ-ya di kwa n'akuku-ọnu-uzọ n'ọnu-uzọ-ama nile; n'ebe ahu ka ha nāsacha anu àjà-nsure-ọku. 39 Ọzọ, n'ulo-nbata nke ọnu-uzọ-ama ka table abua di n'otù akuku, table abua di kwa n'akuku nke-ọzọ, ha ewe b͕ue n'elu ha àjà-nsure-ọku na àjà-nmehie na àjà-ikpe-ọmuma. 40 Ọzọ, n'otù akuku n'èzí, ebe madu nārigoru oghere nke ọnu-uzọ-ama n'akuku Ugwu, ka table abua di; ọ bu kwa n'akuku ọzọ, nke diri uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama, ka table abua di. 41 Table anọ di n'otù akuku, table anọ di kwa n'akuku nke-ọzọ, n'akuku ọnu-uzọ-ama; ha di table asatọ nke ha nēb͕u ihe nchu-àjà n'elu ha. 42 Table anọ di-kwa-ra àjà-nsure-ọke, nke nkume awara awa, ogologo-ha di otù cubit na nkera, obosara-ha di kwa otù cubit na nkera, idi-elu-ha di kwa otù cubit: n'elu ha ka ha nādọba kwa ihe nile nke ha ji eb͕u anu àjà-nsure-ọku na àjà ọzọ. 43 Nko nke ra ka otù ntù-ọbu-aka di kwa, nke akpọgidesiri ike nime ulo-nbata buruburu n'akuku nile: ọ bu kwa n'elu table nile ahu ka anu nke onyinye iji biaru nso di. 44 Ọzọ, n'èzí ọnu-uzọ-ama di nime ka ime-ulo nke ndi-abù di n'ogige di nime, nke di n'akuku ọnu-uzọ-ama nke Ugwu; iru-ha di kwa n'uzọ Ndida: otù di n'akuku ọnu-uzọ-ama nke Iru-anyanwu nke iru-ya di n'uzọ Ugwu. 45 O we gwam okwu, si, Ime-ulo a, nke iru-ya di n'uzọ Ndida, diri ndi-nchu-àjà ahu, ndi nēdebe ihe-ndebe nke ulo a. 46 Ma ime-ulo a nke iru-ya di n'uzọ Ugwu diri ndi-nchu-àjà ahu, ndi nēdebe ihe-ndebe nke ebe-ichu-àjà: ndia bu umu Zedok, ndi si n'etiti umu Livai abiakute Jehova nso ijere Ya ozi. 47 O we tùa ogige ahu, ogologo-ya di ọgu cubit ise, obosara-ya di kwa ọgu cubit ise, o nwere akuku anọ ra nrata; ebe-ichu-aja di kwa n'iru ulo ahu. 48 O we me ka m'biarue uzọ-nbata nke ulo ahu, o we tùa akuku-ọnu-uzọ nke uzọ-nbata ahu, cubit ise n'otù akuku, cubit ise n'akuku nke-ọzọ: obosara ọnu-uzọ-ama di kwa cubit atọ n'otù akuku, cubit atọ n'akuku nke-ọzọ. 49 Ogologo uzọ-nbata ahu di orú cubit, obosara-ya di kwa cubit iri na otù; ọbuná n'ihe-nrigo ahu nke ha ji arigo ya: ogidi di kwa n'akuku-ọnu-uzọ-ya abua, otù n'otù akuku, otù n'akuku ọzọ.

Ezikiel 41

1 O we me ka m'biarue ulo uku Chineke, o we tùa akuku-ọnu-uzọ-ya, cubit isi n'obosara n'otù akuku, na cubit isi n'obosara n'akuku nke-ọzọ, nka bu obosara ulo-ikwū ahu. 2 Obosara nke ọnu-uzọ di kwa cubit iri; akuku abua nke ọnu-uzọ ahu di kwa cubit ise n'otù akuku, na cubit ise n'akuku nke-ọzọ: O we tùa ogologo-ya, ọgu cubit abua, na obosara-ya, orú cubit. 3 O we ba nime, tùa akuku-ọnu-uzọ ọ bula nke ọnu-uzọ ahu, cubit abua: na ọnu-uzọ, cubit ise; na obosara ọnu-uzọ, cubit asa. 4 O we tùa ogologo-ya, orú cubit, na obosara-ya, orú cubit, n'iru ulo uku Chineke: o we sim, Nka bu ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile. 5 O we tùa mb͕idi ulo ahu, cubit isi; na obosara nke ulo ntà nke akuku n'otù n'otù, cubit anọ, buruburu ulo ahu n'akuku nile ọ bula. 6 Ulo ntà nke akuku di kwa otù ulo ntà nke akuku n'elu ulo ntà nke akuku ọzọ okpukpu atọ, ha di kwa orú na iri n'usoro; ha we ba nime mb͕idi ahu nke diri ulo ahu bayere ulo ntà nke akuku di ya buruburu n'akuku nile, ka ha we jide mb͕idi ahu, ghara ijide mb͕idi ulo onwe-ya. 7 Ulo ntà nke akuku ndia di obosara kari ka ha nāla elu elu n'idi ulo ahu buruburu; n'ihi na idi ulo ahu buruburu nāla elu elu buruburu ulo ahu n'akuku nile: n'ihi nka obosara nke diri ulo ahu di uku kari n'elu; otú a anēsi n'ulo ntà di ala rigorue ulo ntà kachasi elu site n'ulo ntà di n'etiti. 8 M'we hu na ulo ahu nwere ebe di elu buruburu n'akuku nile: ntọ-ala nile nke ulo ntà nke akuku bu ogologo zuru ezu nke ami ahu eji atù ihe, bú cubit uku isi. 9 Ib͕idi nke mb͕idi ahu, nke diri ulo ntà nke akuku, n'èzí, di cubit ise: ma nke fọduru bu ọnọdu nke ulo ntà nke akuku nke diri ulo ahu. 10 N'etiti ime-ulo abua ọ di orú cubit n'obosara buruburu ulo ahu n'akuku nile ọ bula. 11 Ma ọnu-uzọ nke ulo ntà nke akuku chere iru n'ebe ahu fọduru, otù ọnu-uzọ n'uzọ nke Ugwu, na otù ọnu-uzọ n'akuku Ndida: obosara nke ebe ahu nke fọduru di kwa cubit ise buruburu n'akuku nile. 12 Ma ulo ahu anēwu ewu nke di n'iru ebe ekewapuru ekewapu n'akuku n'uzọ Ọdida-anyanwu, obosara-ya di ọgu cubit atọ na iri; mb͕idi nke ulo ahu anēwu ewu di kwa cubit ise n'ib͕idi-ya buruburu n'akuku nile, ogologo-ya di kwa ọgu cubit anọ na iri. 13 Ọ tù-kwa-ra ulo ahu, ogologo-ya di ọgu cubit ise; na ebe ahu ekewapuru ekewapu, na ulo ahu anēwu ewu, na mb͕idi-ya nile, ogologo-ya di ọgu cubit ise; 14 na obosara nke iru ulo ahu, na nke ebe ahu ekewapuru ekewapu chere iru n'Iru-anyanwu, ọgu cubit ise. 15 Ọ tù-kwa-ra ogologo nke ulo ahu anēwu ewu n'iru ebe ahu ekewapuru ekewapu nke di n'azu ya, na ulo-njeghari-ya n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ, ọgu cubit ise; na ulo uku Chineke nke ime-ime, na uzọ-nbata nile nke ogige ahu; 16 nbata-uzọ-ya nile, na window nile emechiri emechi, na ulo-njeghari-ya nile buruburu n'okpukpu atọ ha, nke di na ncherita-iru nbata-uzọ ahu, nke ihe-nmachita nke osisi di ya buruburu n'akuku nile, site kwa n'ala rue window nile; ma window nile bu nke ekpuchiri ekpuchi; 17 rue elu ọnu-uzọ, ọbuná rue ulo ime-ime ya, na n'èzí, ru kwa mb͕idi-ya nile buruburu n'akuku nile n'ime na n'èzí, n'ọtùtù-ha. 18 Ọ bu kwa ihe emeworo ka o yie cherubim na nkwu; otù nkwu di n'etiti cherub na cherub, iru abua ka cherub ọ bula nwere; 19 iru madu we che iru na nkwu ahu di n'otù akuku, iru nwa-ọdum che-kwa-ra iru na nkwu ahu nke di n'akuku nke-ọzọ: otú a ka emere ya n'ulo ahu nile buruburu n'akuku nile. 20 Site n'ala rue elu ọnu-uzọ-ya ka cherubim na nkwu nke emere eme di: otú a ka mb͕idi nke ulo uku Chineke di. 21 Ma ulo uku Chineke ahu, akuku-ọnu-uzọ-ya nwere akuku anọ ra nrata; na iru ebe nsọ ya, n'ile ya anya ọ di ka ulo uku Chineke si di n'ile ya anya. 22 Ebe-ichu-àjà-ya bu osisi, cubit atọ n'idi-elu-ya, ogologo-ya di kwa cubit abua: ọ nwe-kwa-ra nkuku-ya anọ; ogologo-ya na akuku-ya nile bu kwa osisi: o we gwam okwu, si, Nka bu table ahu nke di n'iru Jehova. 23 Ọ bu kwa ọnu-uzọ abua ka ulo uku Chineke na ebe nsọ ya nwere n'otù n'otù. 24 Ọ bu kwa ibo-ọnu-uzọ abua ka ọnu-uzọ ndia nwere n'otù n'otù, bú ibo-ọnu-uzọ abua nke nāga buruburu; ibo-ọnu-uzọ abua diri otù ọnu-uzọ, ibo-ọnu-uzọ abua di-kwa-ra ọnu-uzọ nke-ọzọ. 25 Ihe emere n'elu ha, bú n'elu ibo-ọnu-uzọ nile nke ulo uku Chineke, bu kwa cherubim na nkwu, dika nke emere n'elu mb͕idi-ya nile; nbata-uzọ nke osisi di kwa n'iru uzọ-nbata-ya n'èzí. 26 Window emechiri emechi na nkwu di kwa n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ, n'akuku nile nke uzọ-nbata: otù a ka ulo ntà akuku nile nke ulo ahu na nbata-uzọ-ya nile di.

Ezikiel 42

1 O we me ka m'puta ba n'ogige ahu di n'èzí, n'uzọ ahu nke di n'uzọ Ugwu: o we me ha m'ba n'ime-ulo ahu nke di na ncherita-iru ebe ahu ekewapuru ekewapu, nke di kwa na ncherita-iru ulo ahu anēwu ewu n'akuku Ugwu. 2 N'iru ogologo nke ọgu cubit ise ka ọnu-uzọ nke Ugwu di, obosara-ya di kwa ọgu cubit abua na iri. 3 Na ncherita-iru orú cubit ahu nke diri ogige di nime, na na ncherita-iru pavement nke diri ogige di n'èzí, ka ulo-njeghari nke nēche iru n'ulo-njeghari ọzọ di n'okpukpu atọ. 4 N'iru ime-ulo nile ka otù uzọ-njeghari di, nke di cubit iri n'obosara n'ime, ọ bu uzọ nke di otù cubit: ọnu-uzọ nile ha chere iru n'Ugwu. 5 Ma ime-ulo nke kachasi elu di nkpunkpu kari: n'ihi na ulo-njeghari nēbipu ihe na ndia, kari nke ha nēbipu n'ime-ulo di ala ma-ọbu n'ime-ulo etiti, n'ulo ahu anēwu ewu. 6 N'ihi na okpukpu atọ ka ha di, ha enweghi kwa ogidi dika ogidi nke ogige abua ahu: n'ihi nka emere ka ime-ulo nke kachasi elu di nkpa kari nke di ala na nke etiti site n'ala. 7 Ma mb͕idi nke di n'èzí n'akuku ime-ulo nile, n'uzọ ogige di n'èzí n'iru ime-ulo ahu, ogologo-ya di ọgu cubit abua na iri. 8 N'ihi na ogologo nke ime-ulo nke diri ogige di n'èzí di ọgu cubit abua na iri: ma, le, n'iru ulo uku Chineke ọ di ọgu cubit ise. 9 Site kwa n'okpuru ime-ulo ndia ka nbata di n'akuku Iru-anyanwu, ebe anēsi n'ogige di n'èzí abata nime ha. 10 N'ib͕idi nke mb͕idi ogige n'uzọ Iru-anyanwu, n'iru ebe ahu ekewapuru ekewapu, na n'iru ulo ahu anēwu ewu, ka ime-ulo di iche iche di. 11 Uzọ nke di n'iru ha di kwa ka uzọ nke ime-ulo nke di n'uzọ Ugwu si di n'ile ha anya; dika ogologo-ha si di, otú a ka obosara-ha di: ọpùpù nile ha di ka ikpé nile ha si di, na dika ọnu-uzọ nile ha si di. 12 Ma dika ọnu-uzọ nile nke ime-ulo nile si di nke di n'uzọ Ndida, otú a ka otù ọnu-uzọ si di nke di n'isi uzọ, bú uzọ nke di n'iru mb͕idi n'uzọ Iru-anyanwu, ebe anābà nime ha. 13 O we sim, Ime-ulo nile nke Ugwu na ime-ulo nile nke Ndida, nke di n'iru ebe ahu ekewapuru ekewapu, ime-ulo ahu bu ime-ulo nsọ, ebe ndi-nchu-àjà ndi nọ nso Jehova gēri ihe nile nke kachasi ihe nsọ nile nsọ: n'ebe ahu ka ha gādọba ihe nile kachasi ihe nsọ nile nsọ, na onyinye-inata-iru-ọma, na àjà-nmehie, na àjà-ikpe-ọmuma; n'ihi na ebe ahu di nsọ. 14 Mb͕e ndi-nchu-àjà nābà nime, ha agaghi-esi kwa n'ebe nsọ ahu puta n'ogige di n'èzí, kama n'ebe ahu ka ha gāwusa uwe-ha nke ha ji eje ozi; n'ihi na ihe nsọ ka ha bu: ha ewe yiri uwe ọzọ we biarue ihe diri ndi-ha. 15 Ma mb͕e ọ tùzusiri ulo ime-ime, o we me ka m'puta n'uzọ nke ọnu-uzọ-ama ahu nke iru-ya di n'uzọ Iru-anyanwu, o we tùa ya buruburu n'akuku nile. 16 O were ami ahu o ji atù ihe tùa akuku Iru-anyanwu nnù ami na ọgu ise, o were ami ahu o ji atù ihe tùa ya buruburu. 17 O were ami ahu o ji atù ihe tùa akuku Ugwu buruburu, nnù ami na ọgu ise. 18 Akuku Ndida ka ọ tùru, nnù ami na ọgu ise, o were ami ahu o ji atù ihe tùa ya. 19 O chigharia n'akuku Ọdida-anyanwu, were ami o ji atù ihe tùa ya, nnù ami na ọgu ise. 20 N'akuku anọ ka ọ tùru ya: o nwere mb͕idi buruburu n'akuku nile, ogologo-ya di nnù na ọgu ise, obosara-ya di kwa nnù na ọgu ise, ikpa ókè n'etiti ihe di nsọ na ihe emere ka ọ ghara idi nsọ.

Ezikiel 43

1 O we me ka m'jerue ọnu-uzọ-ama ahu, bú ọnu-uzọ-ama nke nēche iru n'uzọ Iru-anyanwu: 2 ma le, ebube nke Chineke nke Israel si n'uzọ Iru-anyanwu bia: olu-Ya di kwa ka olu ọtutu miri: uwa nwu-kwa-ra enwu site n'ebube-Ya. 3 Ọ di kwa ka ọhù nke m'huru si di n'ile ya anya, dika ọhù m'huru mb͕e m'biara ibibi obodo ahu; ọhù nile di kwa ka ọhù ahu nke m'huru n'akuku osimiri Keba: m'we da kpuchie irum n'ala. 4 Ebube nke Jehova we bata nime ulo-Ya n'uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke iru-ya di n'uzọ Iru-anyanwu. 5 Mọ Chineke we buliem elu, me ka m'bata n'ogige di nime; ma le, ebube nke Jehova juputara n'ulo ahu. 6 M'we nu olu otù onye nāgwam okwu site n'ulo ahu; otù nwoke nēguzo kwa n'akukum. 7 O we sim, Nwa nke madu, nka bu ebe nke oche-ezem, na ebe nke ọbu-ukwu nke ukwum abua, ebe M'gēbi n'etiti umu Israel rue mb͕e ebighi-ebi: ulo Israel agaghi-emeru kwa aha nsọm ọzọ, ha onwe-ha, ma-ọbu ndi-eze-ha, site n'ikwa-iko-ha, na site n'ozu nile nke ndi-eze-ha n'ebe di elu ha; 8 mb͕e ha nētiye nbata-uzọ-ha n'akuku nbata-uzọ nkem, na akuku-ọnu-uzọ-ha n'akuku akuku-ọnu-uzọ nkem, ọ bu kwa nání mb͕idi di n'etiti mu na ha; ha emeruwo kwa aha nsọm site n'ihe-árú-ha nile nke ha meworo: M'we ripia ha n'iwem. 9 Ub͕u a ka ha wezuga ikwa-iko-ha na ozu nile nke ndi-eze-ha n'ebe di anya n'ebe M'nọ, M'gēbi kwa n'etiti ha rue mb͕e ebighi-ebi. 10 Gi onwe-gi, nwa nke madu, gosi ulo Israel ulo a, ka ihere ajọ omume nile ha we me ha: ka ha tù kwa ọtùtù-ya. 11 Ọ buru kwa na ihere ihe nile ha meworo eme ha, gi me ka ha mara òmùmò ulo a, na ọtùtù-ya, na ọpùpù-ya nile, na nbata-ya nile, na òmùmò-ya nile, na ukpuru-ya nile, na òmùmò-ya nile, na iwu-ya nile, de kwa ha n'akwukwọ n'anya-ha: ka ha we debe òmùmò-ya nile, na ukpuru-ya nile, me ha. 12 Nka bu iwu ulo a: n'elu ugwu-ya ókè-ala-ya nile buruburu n'akuku nile di nsọ kachasi ebe nsọ nile. Le, nka bu iwu ulo a. 13 Ma ndia bu ọtùtù ebe-ichu-àjà nime cubit: (cubit ahu bu otù cubit na otù ntù-ọbu-aka: ) ala-ya bu otù cubit, ọ bu kwa otù cubit ka obosara-ya di, ókè-ya n'ọnu-ọnu-ya buruburu bu kwa otù ntù-aka: nka bu kwa ebe-ndọkwasi ebe-ichu-àjà nka. 14 Site n'ala-ya nke di n'ala rue ngwe di ala di cubit abua, obosara-ya di kwa otù cubit; ma site na ngwe dikari ntà rue ngwe dikari uku di cubit anọ, obosara-ya di kwa otù cubit. 15 Ebe-ichu-àjà onwe-ya di kwa cubit anọ; site n'ebe-ichu-àjà we rigo ka mpi anọ di kwa. 16 Ebe-ichu-àjà di cubit iri na abua n'ogologo-ya, na cubit iri na abua n'obosara-ya, ọ rara nrata n'akuku anọ ya rara nrata. 17 Ngwe-ya di kwa cubit iri na anọ n'ogologo-ya, na cubit iri na anọ n'obosara-ya n'akuku anọ ya rara nrata, ókè nke di ya buruburu di kwa nkera cubit; ala o nwere di kwa otù cubit buruburu; ihe-nrigo-ya nēche iru n'Iru-anyanwu. 18 O we sim, Nwa nke madu, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ndia bu ukpuru nke ebe-ichu-àjà nkem n'ubọchi ha gēme ya, isure àjà-nsure-ọku n'elu ya, na iwusa ọbara n'elu ya. 19 I gēnye kwa ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai ndi sitere na nkpuru Zedok, ndi dim nso, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), ijerem ozi, nwa-oke-ehi ibu àjà-nmehie. 20 I gēwere kwa ufọdu n'ọbara-ya, tiyekwasi na mpi anọ ya, na n'elu nkuku anọ nke ngwe-ya, na n'ókè-ya buruburu: i we wepu nmehie-ya, kpuchie nmehie-ya. 21 I gēwere kwa oke-ehi nke àjà-nmehie ahu, ọ gēsure kwa ya n'ebe eleputara eleputa nke ulo a, n'èzí ebe nsọ a. 22 Ma n'ubochi nke-abua i gēweta nkpi nke zuru okè ibu àjà-nmehie; ha gēwepu kwa nmehie nke ebe-ichu-àjà, dika ha si were oke-ehi wepu nmehie-ya. 23 Mb͕e i wepusiri nmehie-ya, i gēweta nso nwa-oke-ehi nke zuru okè, na ebulu nke zuru okè site n'ìgwè ewu na aturu-gi. 24 I gēweta kwa ha nso n'iru Jehova, ndi-nchu-àjà gātusa kwa ha nnú, sure ha ọku, ibu àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova. 25 Ubọchi asa ka i gēdozi otù ewu kwa-ubọchi ibu àjà-nmehie: ọ bu kwa nwa-oke-ehi, na ebulu nke sitere n'ìgwè ewu na aturu, bú anu zuru okè, ka ha gēdozi. 26 Ubọchi asa ka ha gēkpuchi nmehie nke ebe-ichu-àjà, me ka ọ di ọcha; ha ewe mejue ya aka. 27 Mb͕e ha debezusiri ubọchi asa ahu, ọ gēru kwa, n'ubọchi nke-asatọ, we ga n'iru, na ndi-nchu-àjà ganēme àjà-nsure-ọku nile unu na àjà-udo nile unu n'elu ebe-ichu-àjà; ihe-unu gātọkwam utọ; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

Ezikiel 44

1 O we me ka m'laghachi n'uzọ ọnu-uzọ-ama nke ebe nsọ ahu nke di n'èzí, nke nēche iru n'Iru-anyanwu; ma ọnu-uzọ-ama ahu bu nke emechiri emechi. 2 Jehova we sim, Ọnu-uzọ nka gābu ihe emechiri emechi, agaghi-emeghe ya, ọ dighi kwa onye ọ bula gēsi ya bata, n'ihi na Jehova, bú Chineke nke Israel, esiwo ya bata; o we buru ihe emechiri emechi. 3 Ma onye-isi-unu, dika onye-isi ka ya onwe-ya gānọdu ala nime ya iri nri n'iru Jehova; ọ gēsi uzọ nke uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama nka bata, si kwa uzọ-ya pua. 4 O we me ka m'bia n'uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke Ugwu n'iru ulo ahu; m'we hu, ma le, ebube Jehova juputara ulo Jehova: m'we da kpuchie irum n'ala. 5 Jehova we sim, Nwa nke madu, tukwasi obi-gi, were anya-gi abua hu, were nti-gi abua nu ihe ahu nile nke Mu onwem nāgwa gi bayere ukpuru nile nke ulo Jehova, baye-kwa-ra iwu-ya nile; tukwasi kwa obi-gi na nbata ulo a, ya na ọpupu nile nke ebe nsọ a. 6 I gāsi kwa ndi nānupu isi, bú ulo Israel, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: O zuwo unu, site n'ihe-árú nile unu, 7 ebe unu meworo ka ndi ala ọzọ bata, bú ndi anēbighi úgwù n'obi anēbighi kwa úgwù n'anu-aru, inọ n'ebe nsọm, ime ka ọ ghara idi nsọ, bú ulom, mb͕e unu nēweta nrim nso, bú abuba na ọbara, ha we mebie ọb͕ub͕a-ndum, tiyere ihe-árú nile unu. 8 Unu edebeghi kwa ihe-ndebe nke ihe nsọm nile: unu we do ha ndi nēdebe ihe-ndebem n'ebe nsọm nye onwe-unu. 9 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri, Ọ dighi onye ala ọzọ, nke anēbighi úgwù n'obi nke anēbighi kwa úgwù n'anu-aru, gābata n'ebe nsọm, bú onye ala ọzọ ọ bula nke di n'etiti umu Israel. 10 Otú ọ di, ndi Livai ndi si n'ebe M'nọ je n'ebe di anya, mb͕e Israel kpafuru akpafu, ndi siri n'ebe M'nọ kpafue so arusi nile ha; ha aghaghi ibū kwa ajọ omume-ha. 11 Ma ha gābu ndi nēje ozi n'ebe nsọm, ndi-nlekọta n'ọnu-uzọ-ama nile nke ulo nkem, nēje kwa ozi n'ulo ahu: ha onwe-ha gēb͕uru ndim anu àjà-nsure-ọku-ha na nke àjà ọzọ ha, ha onwe-ha gēguzo kwa n'iru ha ijere ha ozi. 12 N'ihi na ha nējere ha ozi n'iru arusi nile ha, we ghọrọ ulo Israel ihe-isu-ngọngọ nke ajọ omume; n'ihi nka ka M'weliri akam imegide ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), ha gēbu kwa ajọ omume-ha. 13 Ma ha agaghi-abiakutem nso, iburum ndi-nchu-àjà, na ibiaru ihe nsọm nile nso, bú ihe nile di nsọ kachasi ihe nsọ nile: ma ha gēbu ọnọdu-ihere-ha, na ihe-árú nile ha nke ha meworo. 14 Ma M'gēme ha ndi nēdebe ihe-ndebe nke ulo a, ifè òfùfè-ya nile, na ime ihe ọ bula nke agēme nime ya. 15 Ma ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, umu Zedok, ndi debere ihe-ndebe nke ebe nsọm mb͕e umu Israel siri n'ebe M'nọ kpafue, ndi ahu gābiakutem nso ijerem ozi; ha gēguzo n'irum iweta nsom abuba na ọbara; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta: 16 ha onwe-ha gābata n'ebe nsọm, ha onwe-ha gābiaru kwa table nkem nso, ijerem ozi, ha gēdebe kwa ihe-ndebem. 17 O gēru kwa, mb͕e ha batara n'ọnu-uzọ-ama nke ogige di nime, na ọ bu uwe flax ka ha gēyi; ọ dighi kwa uwe aji-anu gābiakwasi n'aru ha, mb͕e ha nēje ozi n'ọnu-uzọ-ama nke ogige di nime, na nime ulo. 18 Ihe-ike-n'isi nke flax gādi n'isi-ha, uwe-ukwu nke flax gādi kwa n'úkwù-ha, ha agaghi-eji ihe nākpata ọsusọ ke onwe-ha n'úkwù. 19 Ma mb͕e ha nāpu n'ogige di n'èzí, bú ogige di n'èzí ipukuru ndi Israel, ha gēyipu uwe nile ha, nke onwe-ha nēje ozi nime ha, ha gādọba kwa ha n'ime-ulo nsọ ndia, yiri uwe ọzọ, ka ha we ghara iji uwe-ha do ndi Israel nsọ. 20 Ha agaghi-akọpu kwa isi-ha, ha agaghi-eme kwa ka agiri-isi-ha to ogologo; nání nkpacha ka ha gākpacha isi-ha. 21 Ọ dighi kwa manya-vine onye-nchu-àjà ọ bula gāṅu, mb͕e ha nābata n'ogige di nime. 22 Ọ dighi kwa nwanyi nke di-ya nwuru, ma-ọbu nwanyi nke achupuru achupu, ka ha gālu na nwunye: kama umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke ndi sitere na nkpuru ulo Israel, ma-ọbu nwanyi di-ya nwuru nke bu nwunye onye-nchu-àjà nwuru anwu, ka ha gālu. 23 Ọ bu kwa ndim ka ha gēzí ihe di iche n'etiti ihe nsọ na ihe nādighi nsọ, ọ bu kwa ihe di iche n'etiti ihe di ọcha na ihe ruru árú ka ha gēme ka ha mara. 24 Ọzọ, n'ise-okwu ọ bula ndi ahu gēguzo ikpe ikpe; ikpém nile ka ha gēji kpe ya: ọ bu kwa iwum nile na ukpurum nile nime mb͕em nile akara àkà ka ha gēdebe; ubọchi-izu-ikem nile ka ha gēdo nsọ. 25 Ọ dighi kwa madu nke nwuru anwu ka ha gābiaru nso imeru onwe-ha: ma otú ọ di, ha gēmeru onwe-ha n'ihi nna, na n'ihi nne, na n'ihi nwa-nwoke, na n'ihi nwa-nwanyi, na n'ihi nwa-nne-nwoke, na n'ihi nwa-nne-nwanyi nke nēnweghi di. 26 Mb͕e emesiri ka ọ di ọcha, ọ bu kwa ubọchi asa ka agāguru ya. 27 Ma n'ubọchi ọ gābata n'ebe nsọ, n'ogige di nime, ije ozi n'ebe nsọ, ọ gēweta àjà-nmehie-ya nso; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 28 Ọ gāghọ-kwa-ra na ihe-nketa; Mu onwem bu ihe-nketa-ha: ọ dighi kwa ihe-onwunwe unu gēnye ha n'Israel; Mu onwem bu ihe-onwunwe-ha. 29 Onyinye-inata-iru-ọma na àjà-nmehie na àjà-ikpe-ọmuma ka ndi ahu gēri; ọzọ, ihe nile ọ bula nke ewezugara nye Chineke n'Israel, ha gēnwe ya. 30 Ọzọ, ihe mbu nke nkpuru mbu nile nke ihe ọ bula, àjà-nbuli ọ bula nke ihe ọ bula, site n'àjà-nbuli nile unu, ndi-nchu-àjà gēnwe ya: ọ bu kwa utu ọka mbu unu ka unu gēnye onye-nchu-àjà, ime ka ngọzi dakwasi n'ulo-gi. 31 Ihe ọ bula nke nwuru n'onwe-ya, na ihe adọb͕uru adọb͕u, ma ọ bu anu-ufe ma-ọbu anumanu, ndi-nchu-àjà agaghi-eri ya.

Ezikiel 45

1 Ma mb͕e unu gēme ka ala-unu dayere onwe-unu n'ihe-nketa, unu gēbuliri Jehova àjà-nbuli, bú otù òkè di nsọ nke ala ahu: ogologo-ya gādi orú nnù amì uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri n'ogologo, obosara-ya gādi kwa orú nnù na nnù ise: ihe nsọ ka ọ gābu n'ókè-ala-ya nile buruburu. 2 Site n'ala nka nnù ami na ọgu n'ogologo na nnù na ọgu ise n'obosara gādiri ebe nsọm, ọ gēnwe akuku anọ rara nrata buruburu; ma ọgu cubit abua na iri gāburu ya ebe-ita-nri buruburu. 3 Site n'ọtùtù a ka i gātù kwa, ogologo nke gādi orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri, na obosara nke gādi orú nnù ami na nnù ise: ọ bu kwa nime ya ka ebe nsọ, nke bu ebe di nsọ kachasi ebe nsọ nile, gādi. 4 Òkè nsọ nke ala ahu ka ọ bu; ndi-nchu-àjà, bú ndi-oje-ozi nke ebe nsọ, gēnwe ya, bú ndi nābia nso ijere Jehova ozi; ọ gābu-kwa-ra ha ebe ulo nile ha gādi, na ebe nsọ diri ebe nsọ nkem. 5 Orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri n'ogologo, na orú nnù ami na nnù ise n'obosara, gādiri ndi Livai, bú ndi-oje-ozi nke ulom, ighọrọ ha ihe-onwunwe, orú ime-ulo. 6 Ihe-onwunwe nke obodo a ka unu gēnye kwa, nnù ami iri-na-abua na ọgu iri ka obosara-ya gādi, ogologo-ya gādi kwa orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri, n'akuku àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ: ulo Israel nile gēnwe ya. 7 Ihe onye-isi-unu nwere gādi kwa n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ nke àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ, na nke ihe-onwunwe nke obodo a, n'iru àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ, na n'iru ihe-onwunwe nke obodo a, n'akuku Ọdida-anyanwu chere iru n'Ọdida-anyanwu, na n'akuku Iru-anyanwu chere iru n'Iru-anyanwu: ogologo-ya gādi kwa n'akuku otù nime òkè ndia, site n'ókè-ala Ọdida-anyanwu rue ókè-ala Iru-anyanwu. 8 N'ala nka ọ gāburu ya ihe-onwunwe n'Israel: ndi-isim agaghi-eme kwa ndim ihe-ike ọzọ; kama ala nka ka ha gēnye ulo Israel dika ebo nile ha si di. 9 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: O zuwo unu, unu ndi-isi Israel: wezuganu ime-ihe-ike na ipunara-madu-ihe, menu ihe ekpere n'ikpe na ezi omume; wepunu nchupu-unu nile n'aru ndim; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 10 Ihe-osìsì ziri ezi, na ephah ziri ezi, na bath ziri ezi, ka unu gēnwe. 11 Ephah na bath gābu otù ọtùtù, ka bath we ruta otù uzọ n'uzọ iri nke homer, ka ephah we ruta kwa otù uzọ n'uzọ iri nke homer: dika homer si di, otú a ka ọtùtù-ya gādi. 12 Shekel gābu kwa orú gerah: orú shekel, orú shekel na ise, shekel iri na ise, ka maneh-unu gābu. 13 Nka bu àjà-nbuli nke unu gēbuli; otù uzọ n'uzọ isi nke ephah site na homer nke ọka wheat, unu gēnye kwa otù uzọ n'uzọ isi nke ephah site na homer nke ọka barley: 14 òkè manu, bú nke bath nke manu, gābu kwa otù uzọ n'uzọ iri nke bath sitere na cor, nka bu bath iri, ọbuná otù homer; n'ihi na bath iri bu otù homer: 15 na otù nwa-aturu nke sitere n'ìgwè ewu na aturu, bú nke sitere n'ọgu umu-aturu iri, site n'ebe-ita-nri nke Israel nke miri nēde nke-ọma; ibu onyinye-inata-iru-ọma, na ibu àjà-nsure-ọku, na ibu àjà-udo, ikpuchiri ha nmehie; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 16 Ndi nile nke ala nka gādi n'àjà-nbuli a diri onye-isi n'Israel. 17 Ọlu nke onye-isi ka ọ gābu kwa inye àjà-nsure-ọku nile, na onyinye-inata-iru-ọma, na àjà-ihe-ọṅuṅu, n'ememe nile, na n'ọnwa ọhu nile, na n'ubọchi-izu-ike nile, nime mb͕e nile akara àkà nke ulo Israel: ya onwe-ya gēdozi àjà-nmehie, na onyinye-inata-iru-ọma, na àjà-nsure-ọku, na àjà-udo nile, ikpuchiri ulo Israel nmehie-ha. 18 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ọnwa mbu, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, i gēwere nwa-oke-ehi nke zuru okè; i gēwepu kwa nmehie nke ebe nsọm. 19 Onye-nchu-ajam gēwere ufọdu n'ọbara àjà-nmehie ahu, tiye ya n'akuku-ọnu-uzọ nke ulo a, na n'ebe nkuku anọ nke ngwe diri ebe-ichu-àjà nka, na n'elu akuku-ọnu-uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke ogige di nime. 20 Ọ bu kwa otú a ka i gēme n'ubọchi nke-asa nke ọnwa bayere onye ọ bula nēmehie n'amaghi-ama, baye-kwa-ra onye nēnweghi uche: unu ewe kpuchiere ulo a nmehie-ya. 21 N'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu, ka unu gēnwe ememe ngabiga, bú ememe nke ubọchi asa; achicha ekoghi-eko ka agēri. 22 Onye-isi gēdozi kwa n'ubọchi ahu otù oke-ehi n'ọnọdu onwe-ya na n'ọnọdu ndi nile nke ala nka, ibu àjà-nmehie. 23 N'ubọchi asa nke ememe ahu ọ ganēdozi àjà-nsure-ọku ichuru Jehova, bú oke-ehi asa na ebulu asa nke zuru okè, kwa-ubọchi n'ubọchi asa ahu; na àjà-nmehie, bú otù nkpi, kwa-ubọchi. 24 Onyinye-inata-iru-ọma ka ọ gēdozi kwa, bú otù ephah otù oke-ehi, otù ephah otù ebulu, otù hin nke manu di-kwa-ra otù ephah. 25 N'ọnwa nke-asa, n'ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa ahu, n'ememe ahu, ka ọ ganēme dika ihe ndia si di n'ubọchi asa ya; dika àjà-nmehie, na dika àjà-nsure-ọku, na dika onyinye-inata-iru-ọma, na dika manu.

Ezikiel 46

1 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọnu-uzọ-ama nke ogige di nime nke nēche iru n'Iru-anyanwu gābu ihe emechiri emechi n'ubọchi ọlu isi unu; ma n'ubọchi-izu-ike ka agēmeghe ya, ọ bu kwa n'ubọchi nke ọnwa ọhu ka agēmeghe ya. 2 Onye-isi gēsi kwa n'uzọ uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama n'èzí bata, guzo n'akuku akuku-ọnu-uzọ nke ọnu-uzọ-ama, ndi-nchu-àjà gēdozi kwa àjà-nsure-ọku-ya, na àjà-udo-ya nile, ọ gākpọ kwa isi ala na nbata-uzọ nke ọnu-uzọ-ama, we pua: ma agaghi-emechi ọnu-uzọ-ama rue anyasi. 3 Ndi ala nka gākpọ kwa isi ala n'oghere ọnu-uzọ-ama ahu n'iru Jehova n'ubọchi-izu-ike nile, na n'ọnwa ọhu nile. 4 Ma àjà-nsure-ọku nke onye-isi gēweta nso Jehova n'ubọchi-izu-ike bu umu-aturu isi zuru okè na otù ebulu zuru okè; 5 onyinye-inata-iru-ọma bu kwa otù ephah bayere ebulu ahu, ọ gētiye kwa n'umu-aturu onyinye-inata-iru-ọma, bú onyinye nke aka-ya, ya na manu, otù hin diri otù ephah. 6 Ma n'ubọchi ọnwa ọhu ọ gābu nwa-oke-ehi zuru okè, na umu-aturu isi, na otù ebulu, ihe zuru okè ka ha gābu: 7 ọ bu kwa otù ephah etiyere n'oke-ehi ahu, na otù ephah etiyere n'ebulu ahu, na ihe etiyere n'umu-aturu ahu dika aka-ya gēru, na manu, otù, hin otù ephah, ka o gēji dozie onyinye-inata-iru-ọma. 8 Ma mb͕e onye-isi-unu gābata, uzọ uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama ahu ka ọ gēsi bata, ọ bu kwa uzọ-ya ka ọ gēsi pua. 9 Ma mb͕e ndi ala nka gābia n'iru Jehova nime mb͕e di iche iche akara àkà, onye nēsi uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke Ugwu bata ikpọ isi ala gēsi uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke Ndida pua; ma onye nēsi uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke Ndida bata gēsi uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke Ugwu pua: ọ gaghi-esi uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke o siri bata laghachi, kama otù iru ahu ka ọ gāpu. 10 Ma onye-isi, ọ bu n'etiti ha, mb͕e ha nābata, ka o gēso bata; ọzọ, mb͕e ha nāpu, ha gāpu n'otù. 11 Ọzọ, n'ememe nile na nime mb͕e nile akara àkà onyinye-inata-iru-ọma gābu otù ephah otù oke-ehi, otù ephah otù ebulu, ọ gētiye kwa n'umu-aturu onyinye aka-ya, na manu, otù hin otù ephah. 12 Ma mb͕e onye-isi gēdozi àjà-afọ-ofufo, ma ọ bu àjà-nsure-ọku ma-ọbu àjà-udo, iburu Jehova onyinye-afọ-ofufo, agēmeghere ya ọnu-uzọ-ama ahu nke nēche iru n'Iru-anyanwu, ọ gēdozi kwa àjà-nsure-ọku-ya na àjà-udo-ya nile, dika o si eme n'ubọchi-izu-ike: ọ gāpu kwa, ewe mechie ọnu-uzọ-ama mb͕e ọ pusiri. 13 Ọzọ, otù nwa-aturu nke b͕ara otù arọ nke zuru okè ka i gēdozi ibu àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova kwa-ubọchi: kwa-ututu kwa-ututu ka i gēdozi ya. 14 I gēdozi-kwa-ra ya onyinye-inata-iru-ọma kwa-ututu kwa-ututu, otù uzọ n'uzọ isi nke otù ephah, na manu, otù uzọ n'uzọ atọ nke otù hin, iji gwọ utu ọka flour; ọ bu onyinye-inata-iru-ọma anēnye Jehova mb͕e nile n'ukpuru ebighi-ebi. 15 Otú a ka ha gēdozi nwa-aturu ahu, na onyinye-inata-iru-ọma ahu, na manu ahu, kwa-ututu kwa-ututu, ibu àjà-nsure-ọku mb͕e nile. 16 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Mb͕e onye-isi gēnye onye ọ bula n'umu-ya ndikom onyinye, ihe-nketa-ya ka ọ bu, umu-ya ndikom gēnwe ya; ihe-onwunwe-ha ka ọ bu n'ihe-nketa. 17 Ma mb͕e ọ gēnye otù onye nime ndi-orù-ya onyinye nke sitere n'ihe-nketa-ya, ọ gābu kwa nke ya rue arọ izilaga orù ka o nwere onwe-ya; onyinye ahu we laghachikute onye-isi; nání na ihe-nketa-ya, bú ihe-nketa umu-ya ndikom, nke ha ka ọ gābu. 18 Ọzọ, onye-isi agaghi-ewere ihe ọ bula n'ihe-nketa nke ndim, inapu ha ihe-nketa-ha n'ike; ihe nke si n'ihe-onwunwe-ya puta ka ọ gēme ka umu-ya ndikom keta: ka ndim we ghara ib͕asa, onye ọ bula ọ pua n'ihe-onwunwe-ya. 19 O we me ka m'si na nbata ahu nke di n'akuku ọnu-uzọ-ama ahu bata n'ime-ulo nsọ nile nke ndi-nchu-àjà, nke nēche iru n'Ugwu; ma le, n'ebe ahu ka otù ebe di n'azu ya chere iru n'Ọdida-anyanwu. 20 O we sim, Nka bu ebe ahu ebe ndi-nchu-àjà gēsi anu àjà-ikpe-ọmuma na anu àjà-nmehie, ebe ha gēsi onyinye-inata-iru-ọma; ka ha we ghara iweputa ha n'ogige di n'èzí, ido ndim nsọ. 21 O we me ka m'puta ba n'ogige di n'èzí, o we me ka m'gabiga na nkuku anọ nke ogige ahu; ma, le, otù ogige di na nkuku ọ bula nke ogige ahu n'otù n'otù. 22 Nime nkuku anọ nke ogige ahu ka ogige di nke ejikọtara ejikọta, ọgu cubit abua n'ogologo, orú cubit na iri n'obosara: otù ọtùtù diri ha anọ nime nkuku anọ ahu. 23 Ọzọ, otù ariri ulo di buruburu nime ha, buruburu ha anọ, bú ulo ewuru nwere ebe-isi-ite n'okpuru ariri nile buruburu. 24 O we sim, Ndia bu ulo nke ndi nēsi ite, ebe ndi-oje-ozi nke ulo a gēsi anu àjà ndi Israel.

Ezikiel 47

1 O we me ka m'laghachi rue ọnu-uzọ ulo ahu; ma, le, miri nēsi n'okpuru nbata-uzọ nke ulo ahu n'akuku Iru-anyanwu puta, n'ihi na iru ulo ahu di n'Iru-anyanwu: miri ahu nēsi kwa n'okpuru rùda, site n'akuku aka-nri nke ulo ahu, site n'akuku Ndida nke ebe-ichu-àjà. 2 O we me ka m'si uzọ nke ọnu-uzọ-ama ahu n'akuku Ugwu puta, o we me ka m'ga buruburu n'uzọ di n'èzí rue ọnu-uzọ-ama di n'èzí, n'uzọ nke nēche iru n'Iru-anyanwu; ma le, miri nēsi n'akuku aka-nri rùputa nke-ntà nke-ntà. 3 Mb͕e nwoke ahu puru ga n'Iru-anyanwu jide eriri n'aka-ya, o we tùa nnù cubit abua na ọgu iri, me ka m'gabiga miri ahu, ọ bu miri nke ruru nkwonkwo-ukwu. 4 O we tùa nnù cubit abua na ọgu iri, me ka m'gabiga miri ahu, ọ bu miri nke ruru ikperè-ukwu. O we tùa nnù cubit abua na ọgu íri, me ka m'gabiga, ọ bu miri nke ruru úkwù. 5 O we tùa nnù cubit abua na ọgu iri; ọ bu osimiri nke m'nāpughi igabiga: n'ihi na miri ahu etowo eto, buru miri ogwugwu, osimiri nke anāgaghi-agabiga. 6 O we sim, Ì huwo nka, nwa nke madu? O we me ka m'je, ọ we me ka m'laghachi n'usọ osimiri ahu. 7 Mb͕e m'laghachiri, le, n'usọ osimiri ahu ka ọtutu osisi nke bara uba nke-uku di, n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ. 8 O we sim, Miri ndia nāpu ga na buruburu-ala Iru-anyanwu, ha we rùda n'Araba, rùrue oké osimiri ahu; nime oké osimiri ahu ka miri ahu nke anēme ka ha puta gērùbà; ewe gwọ miri-ya. 9 Ọ gēru kwa, na anu nile ọ bula nke nwere nkpuru-obi di ndu gādi ndu, bú nke nēnuputa enuputa, n'ebe ọ bula osimiri abua ndia gērute; azù nke bara uba nke-uku gādi kwa: n'ihi na miri ndia eruwo n'ebe ahu, ewe gwọ miri nke oké osimiri ahu, ihe nile ọ bula gādi kwa ndu n'ebe osimiri ahu gērute. 10 Ọ gēru kwa, na ndi-ọkù gēguzo n'akuku ya: site n'En-gedi we rue En-eglaim gābu ebe ib͕asa ub͕u; iche iche ka azù-ha gādi, dika azù oké osimiri uku, bara uba nke-uku. 11 Ma ebe-ya nile nke bu nání apiti, na ọdọ-miri-ya nile, agaghi-agwọ ha; nnú ka agārara ha nye. 12 Ọ bu kwa n'osimiri ahu, n'usọ-ya, n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ, ka osisi ọ bula nke nāmi nkpuru oriri gēto, akwukwọ-ya agaghi-akpọnwu, nkpuru-ya agaghi-agwu kwa: kwa-ọnwa ka ọ gēme nkpuru mbu, n'ihi na miri-ya, n'ebe nsọ Chineke ka ha si aputa: nkpuru-ya ewe buru ihe-oriri; akwukwọ-ya gābu kwa ihe igwọ agwọ. 13 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Nka gābu ókè-ala, nke unu gēsi ketara onwe-unu ala nka dika ebo iri na abua nke Israel si di: Josef gēnweta òkè ala di iche iche. 14 Unu gēketa kwa ya, otù onye dika nwa-nne-ya; n'ihi na ewelirim akam inye ya nna-unu-hà: ala nka gādaye n'aka-unu n'ihe-nketa. 15 Nka gābu kwa ókè-ala nke ala-unu: n'akuku Ugwu, site n'oké osimiri uku, n'uzọ Hetlon, rue nbata Zedad; 16 Hemat, Berota, Sibraim, nke di n'etiti ókè-ala Damaskọs na ókè-ala Hemat; Haza-hatikon, nke di n'ókè-ala Hauran. 17 Ókè-ala site n'oké osimiri gābu kwa Haza-inon n'ókè-ala Damaskọs, ma n'Ugwu n'akuku Ugwu bu ókè-ala Hemat. Nka bu kwa akuku Ugwu. 18 Ma akuku Iru-anyanwu, site n'etiti Hauran na Damaskọs na Gilead, na ala Israel, gābu Jọdan; site n'ókè-ala Ugwu rue oké osimiri nke Iru-anyanwu ka unu gātù. Nka bu kwa akuku Iru-anyanwu. 19 Ma akuku Ndida nke nēche iru na Ndida gēsite na Tema rue miri Meribot-kedesh, rue miri-iyi Ijipt, rue oké osimiri uku. Nka bu kwa akuku Ndida nēche iru na Negeb. 20 Ma akuku Ọdida-anyanwu gābu oké osimiri uku, site n'ókè-ala Ndida rue na ncherita-iru nbata Hemat. Nka bu akuku Ọdida-anyanwu. 21 Unu ewe ketara onwe-unu ala nka dika ebo nile nke Israel si di. 22 Ọ gēru kwa, na unu gēme ka ọ dayere unu n'ihe-nketa, ka ọ daye-kwa-ra ndi-ọbìa ndi nọ dika ọbìa n'etiti unu, ndi muworo umu n'etiti unu: ha gādi kwa unu dika ndi amuru n'ala n'etiti umu Israel; ha gēso unu dabà n'ihe-nketa n'etiti ebo nile nke Israel. 23 Ọ gēru kwa na, n'ebe ahu nke ọbìa nọ dika ọbìa nime ya, n'ebe ahu ka unu gēnye ya ihe-nketa-ya; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

Ezikiel 48

1 Ma ndia bu aha ebo nile: site na nsọtu Ugwu, n'akuku uzọ Hetlon rue nbata Hemat, Haza-inon n'ókè-ala Damaskọs, n'akuku Ugwu n'akuku Hemat; ọ gēnwe kwa akuku Iru-anyanwu na nke Ọdida-anyanwu; Dan, otù òkè. 2 N'akuku ókè-ala Dan, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Asha, otù òkè. 3 N'akuku ókè-ala Asha, site n'akuku Iru-anyanwu we rue akuku Ọdida-anyanwu; Naftali, otù òkè. 4 N'akuku ókè-ala Naftali, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Manase, otù òkè. 5 N'akuku ókè-ala Manase, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Efraim, otù òkè. 6 N'akuku ókè-ala Efraim, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Reuben, otù òkè. 7 N'akuku ókè-ala Reuben, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku ọdida-anyanwu; Juda, otù òkè. 8 Ma n'akuku ókè-ala Juda, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu, ka àjà-nbuli nke unu gēbuli gādi, orú nnù amì uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri bu obosara-ya, ogologo-ya gādi kwa ka otù nime òkè ndia, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu: ebe nsọ Chineke gādi kwa n'etiti ya. 9 Àjà-nbuli ahu nke unu gēbuliri Jehova, ogologo-ya gādi orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri, obosara-ya gādi kwa orú nnù ami na nnù ise. 10 Ọ bu kwa ndia, bú ndi-nchu-àjà, gēnwe àjà-nbuli nsọ ahu; n'akuku Ugwu orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri n'ogologo, n'akuku Ọdida-anyanwu obosara-ya di orú nnù na nnù ise, n'akuku Iru-anyanwu obosara-ya di orú nnù ise, n'akuku Ndida ogologo-ya di orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri: ebe nsọ nke Jehova gādi kwa n'etiti ya. 11 Ọ gādiri ndi-nchu-àjà ndi edoworo nsọ site n'umu Zedok, ndi debeworo ihe-ndebem; ndi nākpafughi mb͕e umu Israel kpafuru akpafu, dika ndi Livai kpafuru. 12 Ọ gābu-kwa-ra ha àjà-nbuli sitere n'àjà-nbuli nke ala nka, ihe di nsọ kachasi ihe nsọ nile, n'ókè-ala ndi Livai. 13 Ma n'akuku ókè-ala ndi-nchu-àjà, ka ndi Livai gēnwe orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri n'ogologo, obosara-ya gādi orú nnù na nnù ise. Ogologo nile gādi orú nnù uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri, obosara gādi kwa orú nnù na nnù ise. 14 Ha agaghi-erepu ihe ọ bula nime ya, ha agaghi-ab͕anwe kwa ya, agaghi-eme kwa ka nkpuru mbu ala ahu gabiga n'ebe ọzọ: n'ihi na ihe nsọ ka ọ buru Jehova. 15 Ma nnù ami iri-na-abua na ọgu iri nke fọduru n'obosara-ya, n'iru orú nnù uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri ahu, ihe nādighi nsọ ka ọ gābu, ọ gādiri obodo Jerusalem, ibu ebe-obibi na ibu ebe-ita-nri: obodo gādi kwa n'etiti ya. 16 Ma ndia gābu ọtùtù-ya; akuku Ugwu nnù iri-na-otù na ọgu ise, akuku Ndida nnù iri-na-otù na ọgu ise, n'akuku Iru-anyanwu nnù iri-na-otù na ọgu ise, na akuku Ọdida-anyanwu nnù iri-na-otù na ọgu ise. 17 Ebe-ita-nri ka obodo ahu gēnwe kwa; n'akuku Ugwu ọgu ami iri-na-abua na iri, n'akuku Ndida ọgu iri-na-abua na iri, n'akuku Iru-anyanwu ọgu iri-na-abua na iri, n'akuku Ọdida-anyanwu ọgu iri-na-abua na iri. 18 Ma nke fọduru n'ogologo-ya, n'akuku àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ, gādi orú nnù ami na nnù ise n'akuku Iru-anyanwu, na orú nnù na nnù ise n'akuku Ọdida-anyanwu: ọ gādi kwa n'akuku àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ; ihe-ọmume-ya gābu-kwa-ra ndi nēfè obodo òfùfè nri. 19 Ọ bu kwa ndi nēfè obodo òfùfè gālu ya ubi, bú ndi sitere n'ebo nile nke Israel. 20 Àjà-nbuli ahu nile gādi orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri n'ogologo, na orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri n'obosara: ihe nke nwere akuku anọ rara nrata, otú a ka unu gēbuli àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ, tiyere ihe-onwunwe nke obodo. 21 Ma nke fọduru gādiri onye-isi, n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ nke àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ, na nke ihe-onwunwe nke obodo, n'iru orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri nke àjà-nbuli ahu rue ókè-ala Iru-anyanwu, na n'akuku Ọdida-anyanwu n'iru orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri ahu rue ókè-ala Ọdida-anyanwu, n'akuku òkè nile, ọ gādiri onye-isi: àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ, na ebe nsọ nke ulo Chineke gādi kwa n'etiti ya. 22 Ọzọ, site n'ihe-onwunwe nke ndi Livai, site kwa n'ihe-onwunwe nke obodo, n'etiti ala nke onye-isi nwere, n'etiti ókè-ala Juda na ókè-ala Benjamin, onye-isi gēnwe nke ahu. 23 Ma ebo nile nke fọduru: site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Benjamin, otù òkè. 24 N'akuku ókè-ala Benjamin, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Simeon, otù òkè. 25 N'akuku ókè-ala Simeon, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Isaka, otù òkè. 26 N'akuku ókè-ala Isaka, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Zebulun, otù òkè. 27 N'akuku ókè-ala Zebulun, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Gad, otù òkè. 28 Ma n'akuku ókè-ala Gad, n'akuku Ndida, nke nēche iru na Ndida, ókè-ala gēsite ọbuná na Tema rue miri Meribat-kedesh, rue miri-iyi Ijipt, rue oké osimiri uku. 29 Nka bu ala ahu nke unu gēme ka ọ dayere ebo nile nke Israel n'ihe-nketa, ọ bu kwa ndia bu òkè-ha; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 30 Ma ndia bu ọpupu obodo Jerusalem nka; n'akuku Ugwu nnù ami iri-na-otù na ọgu ise n'ọtùtù: 31 ọnu-uzọ-ama nile nke obodo gādi ka aha ebo nile nke Israel si di; ọnu-uzọ-ama atọ n'akuku Ugwu: ọnu-uzọ-ama Reuben, otù; ọnu-uzọ-ama Juda, otù; ọnu-uzọ-ama Livai, otù: 32 n'akuku Iru-anyanwu kwa nnù ami iri-na-otù na ọgu ise; na ọnu-uzọ-ama atọ: bú ọnu-uzọ-ama Josef, otù; ọnu-uzọ-ama Benjamin, otù; ọnu-uzọ-ama Dan, otù: 33 n'akuku Ndida kwa nnù ami iri-na-otù na ọgu ise n'ọtùtù; na ọnu-uzọ-ama atọ: ọnu-uzọ-ama Simeon, otù; ọnu-uzọ-ama Isaka, otù; ọnu-uzọ-ama Zebulun, otù: 34 n'akuku Ọdida-anyanwu nnù ami iri-na-otù na ọgu ise, na ọnu-uzọ-ama atọ ha: ọnu-uzọ-ama Gad, otù; ọnu-uzọ-ama Asha, otù; ọnu-uzọ-ama Naftali, otù. 35 Buruburu-ya gādi orú nnù ami uzọ abua na nnù ise: ma aha obodo ahu site n'ubọ̀chi ahu gābu, Jehova nọ n'ebe ahu.

Daniel 1

1 N'arọ nke-atọ nke ọbubu-eze nke Jehoiakim, bú eze Juda, ka Nebukadneza, bú eze Babilon, biara na Jerusalem, nọchigide ya n'agha. 2 Onye-nwe-ayi we were Jehoiakim, bú eze Juda, na ihe ufọdu nke ulo Chineke, nye n'aka-ya; o we chiri ha bia n'ala Shaina n'ulo chi-ya: ọ bu kwa ihe ndia ka ọ chibatara n'ulo àkù nke chi-ya. 3 Eze ahu we si Ashpenaz, bú onye-isi ndi-onozi-ya, ka o me ka ufọdu n'umu Israel bata, bú ufọdu nime nkpuru ala-eze na nime ndi-isi; 4 bú umu-okoro nke ọ dighi ọlu ọ bula di ha n'aru, ndi mara nma n'ile anya, nwe uche n'amam-ihe nile, mara ihe-ọmuma, nāghọta ihe anāma ama, ndi nwe-kwa-ra ike iguzo n'ulo uku eze; ọ si-kwa-ra ya ka o me ka ha muta akwukwọ na asusu nke ndi Kaldea. 5 Eze we keputara ha òkè nke ubọchi ọ bula n'ubọchi-ya site n'ihe-oriri ọma nke eze, na site na manya-vine nke ọ nāṅu, si ka eme ka ha toputa arọ atọ, ka ha we guzo n'iru eze n'ọgwugwu arọ atọ ahu. 6 Ma n'etiti ha ka umu Juda ufọdu di, bú Daniel, na Hananaia, na Mishael, na Azaraia. 7 Onye-isi ndi-onozi we gua ha aha: o we gua Daniel aha Belteshaza, gu kwa Hananaia aha Shedrak, gu kwa Mishael aha Mishak, gu kwa Azaraia aha Abed-nego. 8 Daniel we tiye nka n'obi-ya na ọ gaghi-ewere ihe-oriri ọma eze ma-ọbu manya-vine ọ nāṅu me onwe-ya ka ọ ghara idi nsọ: o we chọ n'aka onye-isi ndi-onozi ka ọ ghara ime onwe-ya onye nādighi nsọ. 9 Chineke we nye Daniel ka enwe ebere na obi-ebere nile n'aru ya n'iru onye-isi ndi-onozi. 10 Onye-isi ndi-onozi we si Daniel, Mu onwem nātu egwu onye-nwem, bú eze, onye keputaworo ihe-oriri-unu na ihe-ọṅuṅu-unu: n'ihi na ọ̀ bú n'ihi gini ka ọ gāhu iru-unu ka ha b͕aruru kari iru umu-okoro ndi-ọb͕ọ-unu? unu ewe me ka eze nara isim na nrà. 11 Daniel we si onye-nlekọta, nke onye-isi ndi-onozi mere ka ọ guru onye-isi Daniel na Hananaia na Mishael na Azaraia: 12 Biko, nānwa ndi-orù-gi ubọchi iri; ka ha nye kwa ayi akukú ufọdu, ayi ewe rie, ka ha nye kwa ayi miri, ayi ewe ṅua. 13 Ka ahú kwa otú ayi di n'iru gi n'ile ayi anya, na otú umu-okoro ndi nēri ihe-oriri ọma eze di n'ile ha anya; ma dika i si hu, meso ndi-orù-gi otú a. 14 O we ge ha nti n'okwu a, we nwa ha ubọchi iri. 15 N'ọgwugwu ubọchi iri ewe hu na ha di nma n'ile ha anya, ha ma-kwa-ra abuba n'anu-aru, kari umu-okoro ahu nile ndi nēri ihe-oriri ọma eze. 16 Onye-nlekọta ahu we nēwepu ihe-oriri ọma ha na manya-vine ha ganāṅu, o we nēnye ha akukú. 17 Ma umu-okoro anọ ndia, Chineke nyere ha ọmuma-ihe na uche n'akwukwọ na amam-ihe nile: Daniel ghọta-kwa-ra ọhù na nrọ nile. 18 Ma n'ọgwugwu ubọchi ndia nke eze siri ka eme ka ha bata, onye-isi ndi-onozi we me ka ha bata n'iru Nebukadneza. 19 Eze we kpayere ha uka; ma ahughi n'etiti ha nile onye ọ bula di ka Daniel na Hananaia na Mishael na Azaraia: ha we guzo n'iru eze. 20 Ma n'okwu ọ bula nke amam-ihe nke nghọta, nke eze chọrọ n'aka ha, ọ huru na ha ka ndi-ode-akwukwọ di nsọ nile na ndi-dibia nile ndi nọ n'ala-eze-ya nile nma ub͕ò iri. 21 Daniel we nọgide rue arọ mbu nke Sairọs, bú eze.

Daniel 2

1 Ma n'arọ nke-abua nke ọbubu-eze nke Nebukadneza, Nebukadneza rọrọ nrọ di iche iche; mọ-ya we basasia, ura-ya we gwu n'anya-ya. 2 Eze we si ka akpọ ndi-ode-akwukwọ di nsọ na ndi-dibia na ndi-mb͕asi na ndi Kaldea igosi eze nrọ-ya nile. Ha we bata guzo n'iru eze. 3 Eze we si ha, Nrọ ka m'rọworo, mọm we b͕asasia imara nrọ ahu. 4 Ndi Kaldea we si eze n'asusu Siria, Eze, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi: zere ndi-orù-gi nrọ ahu, isi-ya ka ayi gākọ kwa. 5 Eze we za, si ndi Kaldea, Okwu nke siworo n'ọnum puta nēguzosi ike: asi na unu emeghi ka m'mara nrọ a na isi-ya, agābọkasi unu, ọ bu kwa ulo nile unu ka agēme ebe-ikpofu-ahihia. 6 Ma asi na unu akọ nrọ a na isi-ya, onyinye di iche iche na ugwọ-ọlu na nsọpuru uku ka unu gānata n'akam: n'ihi nka kọrọnum nrọ a na isi-ya. 7 Ha zara nke ub͕ò abua, si, Ka eze zere ndi-orù-ya nrọ a, isi-ya ka ayi gākọ kwa. 8 Eze zara, si, Mu onwem amasiwo na mb͕e a ka unu onwe-unu nāzuchapu, n'ihi na unu ahuwo na o nēguzosi ike site n'ọnum, bú okwu a: 9 na asi na unu emeghi ka m'mara nrọ a, otù ka iwu enyere unu bu: n'ihi na okwu-ugha nke bibi-kwa-ra ebibi ka unu zubekọworo ikwu n'irum, rue mb͕e mb͕e a gērughari: n'ihi nka zerem nrọ a, m'we mara na unu gākọrọm isi-ya. 10 Ndi Kaldea zara n'iru eze, si, Ọ dighi onye ọ bula n'elu uwa nke puru ikọ isi okwu eze: n'ihi na ọ dighi eze ọ bula, ma-ọbu onye-isi, ma-ọbu onye nwere ike n'aru madu, juworo ode-akwukwọ di nsọ ọ bula, ma-ọbu dibia ọ bula, ma-ọbu onye Kaldea ọ bula, ajuju di otú a. 11 Ajuju a nke eze nāju di ike, ọ dighi kwa onye ọzọ nke gākọ ya n'iru eze, ma-ọbughi nání chi-ayi, ndi ebe-obibi-ha nādighi n'etiti anu-aru, bú madu. 12 N'ihi nka eze were iwe, iwe-ya we di ọku nke-uku, o we si ka eme ka ndi-amam-ihe nile nke Babilon la n'iyi. 13 Iwu ahu we puta; ewe gaje ib͕u ndi ahu mara ihe; ha we chọ Daniel na ndi-ibe-ya ka ewe b͕ue ha. 14 Mb͕e ahu Daniel zaghachiri Ariok, bú onye-isi ndi-ob͕ū nke eze, nke puru ib͕u ndi-amam-ihe nke Babilon, okwu ndum-ọdu na ezi uche; 15 ọ zara, si Ariok, bú onye nke eze nke nwere ike n'aru madu, N'ihi gini ka iwu a di ọku ọku site n'iru eze? Mb͕e ahu ihe Ariok mere ka Daniel mara okwu a. 16 Daniel we bata, kpere eze ka o nye ya mb͕e akara àkà, ka o we kọrọ eze isi nrọ ahu. 17 Mb͕e ahu Daniel lara n'ulo-ya, me ka Hananaia na Mishael na Azaraia, bú ndi-ibe-ya, mara okwu ahu: 18 ka ha we riọ obi-ebere nile n'aka Chineke nke elu-igwe bayere ihe-nzuzo ahu; ka Daniel na ndi-ibe-ya we ghara isoro ndi-amam-ihe Babilon fọduru la n'iyì. 19 Mb͕e ahu Daniel ka ekpughere ihe-nzuzo ahu nye n'ọhù nke abali. Mb͕e ahu Daniel gọziri Chineke nke elu-igwe. 20 Daniel zara, si, Ka aha nke Chineke buru ihe agọziri agọzi site na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi: n'ihi na amam-ihe na idi-ike, nke Ya ka ha bu: 21 ọ bu Ya onwe-ya nāb͕anwe mb͕e na mb͕e akara àkà: Ọ nēwezuga ndi-eze, nēme kwa ka ndi-eze bilie: Ọ nēnye ndi mara ihe amam-ihe-ha, Ọ nēnye kwa ndi mara nghọta ihe-ọmuma: 22 Ya onwe-ya nēkpughe ihe nile di omimi di kwa nzuzo: Ọ mawo ihe di n'ọchichiri, ìhè nēbi kwa n'ebe Ọ nọ. 23 Gi, Chineke nke nnam-hà, ka mu onwem nēkele, nāja kwa, n'ihi na amam-ihe na idi-ike ka I nyeworom, ub͕u a ka I mewo-kwa-ra ka m'mara ihe ayi riọrọ n'aka Gi: n'ihi na okwu eze ka I meworo ka ayi mara. 24 N'ihi nka Daniel bàkuru Ariok, onye eze doro onye-isi ime ka ndi-amam-ihe nke Babilon la n'iyì: o jere, ọ bu kwa otú a ka ọ siri ya; Emela ka ndi-amam-ihe nke Babilon la n'iyì: me ka m'bata guzo n'iru eze, ọ bu kwa isi nrọ ahu ka m'gākọrọ eze. 25 Mb͕e ahu Ariok were ọsọ me ka Daniel bata n'iru eze, ọ bu kwa otú a ka ọ siri ya, Achọputawom otù nwoke nime umu ndi Juda emere ka ha je biri n'ala ọzọ, onye gēme ka eze mara isi nrọ ahu. 26 Eze zara, si Daniel, onye aha-ya bu Belteshaza, Ọ̀ gābu na i puru ime ka m'mara nrọ a nke m'huworo, na isi-ya? 27 Daniel zara n'iru eze, si ihe-nzuzo nke eze juworo, ndi mara ihe na ndi-dibia na ndi-ode-akwukwọ di nsọ na ndi nēkè elu-igwe apughi ikọrọ eze ya; 28 ma Chineke di, Onye nọ n'elu-igwe, Nke nēkpughe ihe-nzuzo nile, O mewo kwa ka eze, bú Nebukadneza, mara ihe aghaghi idi n'ikpe-azu ubọchi ndia. Nrọ-gi, na ọhù nile nke isi-gi n'elu ihe-ndina-gi, nka ka ọ bu: 29 gi onwe-gi, eze, èchìchè-gi nile rigotara n'uche-gi n'elu ihe-ndina-gi, ihe aghaghi idi mb͕e nka gasiri: Onye ahu nke nēkpughe ihe-nzuzo nile emewo kwa ka i mara ihe aghaghi idi. 30 Ma mu onwem, ọ bughi n'ihi amam-ihe ọ bula nke di nimem kari n'ihe ọ bula di ndu ka ekpugheworo ihe-nzuzo a nyem, kama ọ bu ka ewe me ka eze mara isi-ya, ọ bu kwa ka i we mara èchìchè nke obi-gi. 31 Gi onwe-gi, eze, nọ nāhu, ma le, otù onyinyo madu nke di uku. Onyinyo a, nke riri nne, nke ib͕u-maramara-ya kachasi ihe nile, nēguzo n'iru gi; ọ di egwu n'ile ya anya. 32 Onyinyo ahu, isi-ya bu ezi ọla-edo, obi-ya na ogwe-aka-ya abua bu ọla-ọcha, afọ-ya na apata-ukwu-ya abua bu ọla, 33 ogwe-ukwu-ya abua bu ígwè, ukwu-ya abua, ufọdu nime ha bu ígwè ma ufọdu nime ha bu urọ. 34 I nọ nāhu rue mb͕e awaputara otù nkume nke anējighi aka wa, o we tie onyinyo ahu n'ukwu-ya abua nke bu ígwè na urọ, tipia ha. 35 Mb͕e ahu ka etipiara ígwè ahu na urọ na ọla ahu na ọla-ọcha ahu na ọla-edo ahu n'otù, o we di ka ib͕ob͕o-ọka sitere n'ebe-nzọcha-ọka nke mb͕e okpom-ọku; ifufe we fechapu ha, ewe ghara ihuru ha ebe ọ bula: nkume ahu nke tipiara onyinyo ahu we ghọ oké ugwu, juputa uwa nka nile. 36 Nka bu nrọ ahu: isi-ya ka ayi gākọ kwa n'iru eze. 37 Gi onwe-gi, eze, bu eze ndi-eze, onye Chineke nke elu-igwe nyeworo ala-eze a na àkù a na ike a na ebube a; 38 ọzọ, n'ebe ọ bula umu nke madu di, anu ọhia na anu-ufe nke elu-igwe ka O nyeworo n'aka-gi, me ka i nwe ike n'aru ha nile: gi onwe-gi bu isi ọla-edo ahu. 39 Ma n'ọnọdu gi ka ala-eze ọzọ gēbili nke gādi ala kari gi; na ala-eze ọzọ nke mere ha atọ, nke bu ọla, nke gēnwe ike n'aru uwa nka nile. 40 Ma ala-eze nke-anọ gādi ike ka ígwè: n'ihi na ígwè nētipia tida kwa ihe nile: na dika ígwè nke nētijisi ihe ndia nile, otú a ka ọ gētipia, tijisia. 41 Ma ebe i huru ukwu-ya abua na nkpisi-ukwu-ya nile, na ufọdu nime ha bu urọ ọkpu-ite, ma ufọdu nime ha bu ígwè, ala-eze ekewara ekewa ka ọ gābu; ma nguzosi-ike ufọdu nke ígwè ahu aghaghi idi nime ya, n'ihi na i huru ígwè ahu na agwakọtara ya na urọ apiti. 42 Ma nkpisi-ukwu nile nke ukwu-ya abua, ufọdu nime ha bu ígwè, ma ufọdu nime ha bu urọ, otú a ufọdu nime akuku ala-eze ahu gādi ike, ma ufọdu nime ya gābu ihe nādighi ike ntiwa. 43 Ma ebe i huru ígwè ahu na agwakọtara ya na urọ apiti, ha ganēji nkpuru ndi ọzọ gwakọta onwe-ha; ma ha agaghi-adi nārapara n'aru ibe-ha n'otù n'otù, ọbuná otú ígwè na urọ nādighi-agwakọta. 44 Ma n'ubọchi-ha, bú eze ndia, ka Chineke nke elu-igwe gēme ka otù ala-eze bilie, nke agaghi-emebi emebi rue mb͕e abighi-ebi, ọ bu kwa ọbubu-eze-ya ka anāgaghi-arapuru ndi ọzọ; ọ gētipia ala-eze ndia nile me ka ha gwusia, ma ya onwe-ya gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi. 45 N'ihi na i huru na awaputara otù nkume n'ugwu ahu nke anējighi aka wa, na o tipiara ígwè ahu na ọla ahu na urọ ahu na ọla-ọcha ahu na ọla-edo ahu; Chineke di uku emewo ka eze mara ihe aghaghi idi mb͕e nka gasiri: nrọ a nēguzosi kwa ike, ọ bu kwa ihe kwesiri ntukwasi-obi ka akukọ-isi-ya bu. 46 Mb͕e ahu ka eze, bú Nebukadneza, ji da kpue iru-ya n'ala, ọ bu kwa Daniel ka ọ kpọrọ isi ala nye, si ka awusiri ya onyinye-inata-iru-ọma na ihe ísì utọ di iche iche. 47 Eze zara Daniel, si, N'ezi-okwu Chineke-unu bu Chineke nke chi nile, na Onye-nwe ndi-eze, na Onye nēkpughe ihe-nzuzo nile, ebe i puru ikpughe ihe-nzuzo a. 48 Mb͕e ahu eze mere ka Daniel di uku, ọ di kwa ọtutu onyinye di uku ka o nyere ya, o me-kwa-ra ya ka ọ buru onye nāchi ala ahu nile anāchi achi, bú Babilon, na onye-isi ndi nọchiri anya eze n'ichi ndi-amam-ihe nile nke Babilon. 49 Daniel we riọ eze, o we do Shedrak na Mishak na Abed-nego ndi-isi ọlu nke ala ahu anāchi achi, bú Babilon: ma Daniel nọ n'ọnu-uzọ-ama eze.

Daniel 3

1 Nebukadneza, bú eze, mere onyinyo ọla-edo, idi-elu-ya bu ọgu cubit atọ, obosara-ya bu cubit isi: ọ guzobere ya ọtọ na ndagwurugwu Dura n'ala-ọchichi Babilon. 2 Nebukadneza, bú eze, zi-kwa-ra ka achikọta ndi nọchiri anya eze, na ndi-isi, na ndi nāchi achi, na ndi-ikpé, na ndi-odozi-àkù, na ndi-ndum-ọdu, na ndi-odozi-okwu, na ndi nile nāchi ala anāchi achi, ibia n'irara onyinyo ahu nye, bú nke Nebukadneza, bú eze, guzobeworo ọtọ. 3 Mb͕e ahu ndi nọchiri anya eze, na ndi-isi, na ndi nāchi achi, na ndi-ikpe, na ndi-odozi-àkù, na ndi-ndum-ọdu, na ndi-odozi-okwu, na ndi nile nāchi ala anāchi achi, nēzukọta n'irara onyinyo ahu nye, bú nke Nebukadneza, bú eze, guzobere ọtọ; ha we nēguzo ọtọ n'iru onyinyo ahu nke Nebukadneza guzobere. 4 Onye-nkwusa nākpọsi kwa nkpu ike, si, Ọ bu unu ka anāgwa okwu, unu ndi di iche iche, na unu mba di iche iche, na unu ndi nāsu asusu di iche iche, si, 5 Na mb͕e ahu mb͕e unu gānu olu nke opì-ike, na nke ọ̀jà, na nke ubọ-akwara, na nke sackbut, na nke une, na nke dulcimer, na nke ubọ na opì nile di iche iche, unu gāda n'ala, kpọ isi ala nye onyinyo ọla-edo ahu nke Nebukadneza, bú eze, guzobeworo ọtọ: 6 ma onye ọ bula nke nāgaghi-ada n'ala kpọ isi ala, n'otù mb͕e ahu ka agātubà ya n'etiti oké ọku nke nēnwu ajọ onwunwu. 7 N'ihi nka, n'otù mb͕e ahu, mb͕e ndi nile di iche nuru olu nke opì-ike, na nke ọ̀jà, na nke ubọ-akwara, na nke sackbut, na nke une, na nke ubọ na opì nile di iche iche, ha we nāda n'ala, bú ndi nile di iche iche, na mba nile di iche iche, na ndi nile nāsu asusu di iche iche, ha we nākpọ isi ala nye onyinyo ọla-edo ahu nke Nebukadneza, bú eze, guzobere ọtọ. 8 N'ihi nka ka ndi Kaldea ufọdu biaruru nso n'otù mb͕e ahu, bo ndi-Ju ebubo. 9 Ha zara, si Nebukadneza, bú eze, Eze, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi. 10 Gi onwe-gi, eze, enyewo iwu, si, na onye ọ bula nke gānu olu nke opì-ike, na nke ọ̀jà, na nke ubọ-akwara, na nke sackbut, na nke une, na nke dulcimer, na nke ubọ na opì nile di iche iche, gāda n'ala kpọ isi ala nye onyinyo ọla-edo ahu: 11 ma onye ọ bula nke nādaghi n'ala kpọ isi ala, agātubà ya n'etiti oké ọku nke nēnwu ajọ onwunwu. 12 Ndi-Ju ufọdu di ndi i doworo ndi-isi ọlu nke ala ahu anāchi achi, bú Babilon, ha bu Shedrak na Mishak na Abed-nego; ndikom ndia anughi olu-gi, eze: chi-gi nile ka ha nādighi-efè, ọ bu kwa onyinyo ọla-edo nke i guzobeworo ọtọ ka ha nādighi-akpọ isi ala nye. 13 Mb͕e ahu Nebukadneza n'oké iwe na ọnuma-ya siri ka eme Shedrak na Mishak na Abed-nego ka ha bia. Mb͕e ahu ha mere ka ndikom ndia bia n'iru eze. 14 Nebukadneza zara, si ha, Ọ̀ bu ihe unu zubeworo, unu Shedrak, na Mishak, na Abed-nego, na chim ka unu nādighi-efè, ọ̀ bu kwa onyinyo ọla-edo nke m'guzobeworo ọtọ ka unu nādighi-akpọ isi ala nye? 15 Ub͕u a asi na unu ejikerewo na mb͕e unu gānu olu nke opì-ike, na nke ọ̀jà, na nke ubọ-akwara, na nke sackbut, na nke une, na nke dulcimer, na nke ubọ na opì nile di iche iche, unu gāda n'ala kpọ isi ala nye onyinyo ahu nke m'meworo, ọ di nma: ma asi na unu adighi-akpọ isi ala, n'otù mb͕e ahu ka agātubà unu n'etiti oké ọku nēnwu ajọ onwunwu; ònye bu kwa chi ahu nke gānaputa unu n'akam? 16 Shedrak na Mishak na Abed-nego zara, si eze, Nebukadneza, ọ dighi ayi onwe-ayi nkpà izaghachi gi okwu bayere nka. 17 Asi na ọ di uzọ ọ bula Chineke ahu Onye ayi onwe-ayi nēfè puru inaputa ayi, ọ bu n'oké ọku nke nēnwu ajọ onwunwu na n'aka-gi, eze, ka Ọ gānaputa ayi. 18 Ma asi na Ọ pughi inaputa ayi, ka i mara, eze, na chi-gi nile ka ayi nāgaghi-adi nēfè, ọ bu kwa onyinyo ọla-edo ahu nke i guzobeworo ọtọ ka ayi nāgaghi-akpọ isi ala nye. 19 Mb͕e ahu Nebukadneza juputara n'ọnuma, udi iru-ya we b͕anwe imegide Shedrak na Mishak na Abed-nego: ya mere ọ zara, si ka ha me oké ọku ahu ka ọ di ọku ub͕ò asa kari otú anēmeri ka ọ di ọku. 20 Ọ si-kwa-ra ndi-dike ufọdu bu dìnkpà, ndi di n'usu-ndi-agha-ya, ka ha ke Shedrak na Mishak na Abed-nego ab͕u, tubà ha n'oké ọku nēnwu ajọ onwunwu. 21 Mb͕e ahu ekere ndikom ndia ab͕u n'uwe-ukwu-ha, na ákwà-nkechi-isi-ha, na uwe-nwuda-ha, na uwe nile ha, ewe tubà ha n'etiti oké ọku nēnwu ajọ onwunwu. 22 N'ihi nka, n'ihi na okwu eze di ọku ọku, na n'ihi na oké ọku ahu bu ihe emeworo ka ọ dikari ọku ókè, ọbuná ndikom ahu ka ire ọku b͕uru, bú ndi meworo ka Shedrak na Mishak na Abed-nego rigota. 23 Ndikom atọ ndia, bú Shedrak na Mishak na Abed-nego, we da n'ala n'ab͕u n'etiti oké ọku nēnwu ajọ onwunwu. 24 Mb͕e ahu o juru Nebukadneza, bú eze, anya, o we were ọsọ bilie: ọ zara, si ndi-ndum-ọdu-ya, Ọ bughi ndikom atọ ekere ab͕u ayi tubàra n'etiti ọku ahu? Ha zara, si eze, Ọ bu ezie, eze. 25 Ọ zara, si, Le, mu onwem nāhu ndikom anọ atọpuru ab͕u, nējeghari n'etiti ọku ahu, ma emerughi ha ahu; onye ahu nke mere ha anọ yiri nwa nke ndi bu chi n'ile ya anya. 26 Mb͕e ahu Nebukadneza biaruru nso ọnu-uzọ oké ọku ahu nke nēnwu ajọ onwunwu: ọ kwuru, si, Shedrak na Mishak na Abed-nego, unu ndi-orù nke Chineke Nke kachasi ihe nile elu, putanu, bia. Mb͕e ahu Shedrak na Mishak na Abed-nego siri n'etiti ọku ahu puta. 27 Ndi ahu ndi nọchiri anya eze, na ndi-isi ahu, na ndi ahu nāchi achi, na ndi-ndum-ọdu eze, ebe ha zukọtaworo, ha hu-kwa-ra ndikom ndia, na ọku ahu enweghi ike n'aru-ha, ọku aṅachaghi kwa agiri-isi nke isi-ha, uwe-ukwu-ha ab͕anweghi kwa, ísì ọku agabigaghi kwa n'aru ha. 28 Nebukadneza zara, si, Onye agọziri agọzi ka Chineke nke Shedrak na Mishak na Abed-nego bu, Onye ziteworo mọ-ozi-Ya, we naputa ndi-orù-Ya ndi tukwasiri Ya obi, ọ bu kwa okwu eze ka ha b͕anweworo, we rara aru-ha nye, ka ha we ghara ifè ma-ọbu ikpọ isi ala nye chi ọ bula, ma-ọbughi Chineke-ha. 29 N'ihi ya anēsite n'akam nye iwu, si, na ndi ọ bula, ma-ọbu mba ọ bula, ma-ọbu asusu ọ bula, nke gēkwuhie megide Chineke nke Shedrak na Mishak na Abed-nego, agābọkasi ya, ọ bu kwa ulo-ya ka agēme ebe-ikpofu-ahihia: n'ihi na ọ dighi chi ọzọ nke puru inaputa otú a. 30 Mb͕e ahu eze mere ka ihe gara Shedrak na Mishak na Abednego nke-ọma n'ala ahu anāchi achi, bú Babilon.

Daniel 4

1 Nebukadneza, bú eze, nēzigara ndi nile di iche iche, na mba nile, na ndi nile nāsu asusu di iche iche, ozi, bú ndi bi n'uwa nka nile; ka udo bara unu uba. 2 Ihe-iriba-ama nile na ihe-iju-anya nile nke Chineke Onye kachasi ihe nile elu meworo n'imesom, ọ dim nma n'anya ikọ akukọ ha. 3 Ihe-iriba-ama-Ya nile, le ka ha si di uku ri nne! ihe-iju-anya-Ya nile kwa, le ka ha si di ike nke-uku! ala-eze-Ya bu ala-eze ebighi-ebi, ọchichi-Ya nādigide kwa n'ọb͕ọ nile. 4 Mu onwem, bú Nebukadneza, nọ n'udo n'ulom, nọ kwa ka osisi nwezuru akwukwọ ndu ya n'ulo ukum. 5 Nrọ ka m'huru, o we me ka m'tua egwu; èchìchè nile m'nēchè n'elu ihe-ndinam na ọhù nile nke isim we me ka m'ma jijiji. 6 N'ihi ya anēsite n'akam nye iwu, si, ka eme ka ndi-amam-ihe nile nke Babilon bata n'irum, ka ha we me ka m'mara isi nrọ ahu. 7 Mb͕e ahu ndi-ode-akwukwọ di nsọ na ndi-dibia na ndi Kaldea na ndi nēkè elu-igwe batara: mu onwem we ze nrọ ahu n'iru ha; ma ha emeghi ka m'mara isi-ya. 8 Ma n'ikpe-azu Daniel batara n'irum, onye aha-ya bu Belteshaza, dika aha chim si di, onye mọ nke chi nsọ nile di kwa nime ya: ọ bu kwa n'iru ya ka m'zere nrọ ahu, si, 9 Belteshaza, onye-isi ndi-ode-akwukwọ di nsọ, n'ihi na mu onwem mara na mọ nke chi nsọ nile di nime gi, na ọ dighi ihe-nzuzo ọ bula nēsob͕u gi, kọrọm ọhù nile nke nrọm nke m'huworo, na isi-ya. 10 Ma ọhù nile nke isim n'elu ihe-ndinam di otú a: anọm nāhu, ma le, otù osisi n'etiti uwa, idi-elu-ya di kwa uku. 11 Osisi ahu b͕ara ab͕a, di ike, idi-elu-ya rute-kwa-ra n'elu-igwe, apuru ihu ya anya site na nsọtu nke uwa nka nile. 12 Akwukwọ-ya mara nma, nkpuru-ya ri-kwa-ra nne, ihe-oriri izùru ihe nile di kwa ya: n'okpuru ya ka anu ọhia nēze ǹdò, ọ bu kwa n'alaka-ya ka nnunu nile nke elu-igwe nēbi, esite kwa na ya zù anu-aru nile, bú madu. 13 Anọm nāhu n'ọhù nile nke isim n'elu ihe-ndinam, ma, le, otù onye nāmuru anya, nke bu kwa onye nsọ, nēsi n'elu-igwe rida. 14 Ọ nākpọsi nkpu ike, ọ bu kwa otú a ka ọ nāsi, B͕utuenu osisi ahu, b͕ukapusia alaka-ya nile, rurupu akwukwọ-ya nile, kpasa nkpuru-ya: ka anu-ọhia si n'okpuru ya b͕apu, ka nnunu nile si kwa n'alaka-ya fepu. 15 Ma rapunu ogwe nkpọrọgwu-ya nile n'ala, ọbuná n'ab͕u ekere ya nke ígwè na ọla, n'ahihia ndu nke ọhia; ka igirigi nke elu-igwe de kwa ya, ka òkè-ya di kwa n'etiti anu-ọhia n'ihe-ọkukú nke uwa: 16 ka obi-ya b͕anwe ghara ibu obi madu, ka enye kwa ya obi anu-ọhia; ka oge asa gabiga kwa ya n'isi. 17 N'iwu ndi nāmu anya nyere ka okwu a siteworo, ọ bu kwa n'okwu-ọnu ndi nsọ ka ihe a si puta: ka ndi di ndu we mara na Onye ahu nke kachasi ihe nile elu nāchi achi n'ala-eze nke madu, ọ bu kwa onye ọ bula Ọ chọrọ inye ya ka Ọ nēnye ya, ọ bu kwa onye di ala kari madu nile ka ọ nēme ka o bilie ibu onye-isi-ya. 18 Nrọ a ka mu onwem, bú eze, bú Nebukadneza, huworo: ma gi onwe-gi, Belteshaza, kọ akukọ-isi-ya, n'ihi na ndi-amam-ihe nile nke ala-ezem apughi ime ka m'mara isi-ya; ma gi onwe-gi puru, n'ihi na mọ nke chi nsọ nile di nime gi. 19 Mb͕e ahu o juru Daniel, onye aha-ya bu Belteshaza, anya nwa mb͕e, èchìchè-ya nile we me ka ọ ma jijiji. Eze zara, si, Belteshaza, ekwela ka nrọ a ma-ọbu akukọ-isi-ya me ka i ma jijiji. Belteshaza zara, si, Onye-nwem, ka nrọ a diri ndi nākpọ gi asì, ka akukọ-isi-ya di-kwa-ra ndi-iro-gi. 20 Osisi ahu nke i huru, nke b͕ara ab͕a, nke di ike, nke idi-elu-ya rutere n'elu-igwe, nke apuru ihu ya anya site na nsọtu nke uwa nka nile; 21 nke akwukwọ-ya mara nma, nke nkpuru-ya riri nne, nke ihe-oriri izuru ihe nile di ya; nke n'okpuru ya ka anu ọhia nēbi, nke ọ bu n'alaka-ya ka nnunu nile nke elu-igwe nwere ebe-obibi-ha: 22 gi onwe-gi ka ọ bu, eze, n'ihi na i bawo uba, di ike: idi-uku-gi abawo kwa uba, rute n'elu-igwe, ebe i nāchi erutewo kwa na nsọtu uwa. 23 Ma ebe eze huru otù onye nāmuru anya, nke bu kwa onye nsọ, ka o nēsi n'elu-igwe ridata, si, B͕utuenu osisi ahu, mebie ya; ma rapunu ogwe nkpọrọgwu-ya nile n'ala, ọbuná n'ab͕u ekere ya nke ígwè na ọla, n'ahihia ndu nke ọhia; ka igirigi nke elu-igwe de kwa ya, ka òkè-ya di kwa n'etiti anu ọhia, rue mb͕e oge asa gāgabiga n'isi ya; 24 nka bu akukọ-isi-ya, eze, iwu nke Onye ahu nke kachasi ihe nile elu ka ọ bu kwa, nke ruteworo onye-nwem, bú eze, aru: 25 ọ bu kwa gi ka agāchupu n'ebe madu bi, ọ bu kwa n'etiti anu ọhia ka ebe-obibi-gi gādi, ọ bu kwa ihe-ọkukú ka agēme ka i ta dika ehi, igirigi nke elu-igwe ganēde kwa gi, oge asa gāgabiga n'isi gi; rue mb͕e i gāma na Onye ahu nke kachasi ihe nile elu nāchi achi n'ala-eze nke madu, ọ bu kwa onye ọ bula Ọ nāchọ inye ya ka Ọ gēnye ya. 26 Ma ebe ha siri ka arapu ogwe nkpọrọgwu nke osisi ahu; ala-eze-gi gēguzosiri gi ike, site na mb͕e i gāma na elu-igwe nāchi achi. 27 N'ihi nka, eze, kwe ka ndum-ọdum di gi nma n'anya, were kwa ezi omume tijipu nmehie-gi nile, were kwa imere ndi ewedara n'ala amara tijipu ajọ omume-gi nile; asi na ogologo mb͕e gādiri udo-gi. 28 Ihe a nile rutere Nebukadneza, bú eze, aru. 29 N'ọgwugwu ọnwa iri na abua, n'elu ulo uku ala-eze ahu nke Babilon ka ọ nọ nējeghari. 30 Eze zara, si, Ọ̀ bughi nka bu Babilon uku a, nke mu onwem wuworo ibu ulo ala-eze, site n'ike nke àkùm na n'ihi ebube nke ima-nmam? 31 Mb͕e eze kpu okwu a n'ọnu, otù olu siri n'elu-igwe da, si, Gi ka anāgwa okwu, Nebukadneza, bú eze, si: Ala-eze apuwo n'aka-gi. 32 Aganēsi kwa n'ebe madu bi chupu gi, ọ bu kwa n'etiti anu ọhia ka ebe-obibi-gi gādi; ihe-ọkukú ka agēme ka i ta dika ehi, oge asa gāgabiga kwa n'isi gi; rue mb͕e i gāma na Onye ahu nke kachasi ihe nile elu nāchi achi n'ala-eze nke madu, ọ bu kwa onye ọ bula Ọ nāchọ ka Ọ nēnye ya. 33 N'otù oge hour ahu ka okwu a rère n'aru Nebukadneza: ewe si n'ebe madu bi chupu ya, ọ bu kwa ihe-ọkukú ka ọ nāta dika ehi, igirigi nke elu-igwe nēde kwa aru-ya, rue mb͕e agiri-isi-ya toputara dika ábúbà ugo, mbọ-aka-ya kwa dika mbọ nnunu. 34 Ma n'ọgwugwu ubọchi ahu nile mu onwem, bú Nebukadneza, weliri anyam abua lekwasi elu-igwe, ihe-ọmumam we laghachikutem, ọ bu kwa Onye ahu nke kachasi ihe nile elu ka m'gọziri, ọ bu kwa Onye ahu nke nādi ndu mb͕e ebighi-ebi ka m'jara sọpuru kwa, Onye ọchichi-Ya bu ọchichi ebighi-ebi, ala-eze-Ya nādigide kwa n'ọb͕ọ nile: 35 ọ bu kwa ndi nile bi n'uwa ka anāgu n'ihe-efu: ọ bu kwa dika O si achọ ka Ọ nēme n'usu-ndi-agha nke elu-igwe, na n'etiti ndi bi n'uwa: ọ dighi kwa onye gēti aka-Ya ihe, si Ya, Gini ka I meworo? 36 N'otù mb͕e ahu ka ihe-ọmumam nālaghachikutem; ọzọ, n'ihi ebube nke ala-ezem, ima-nmam na ib͕u-maramaram nālaghachikutem; ọ bu kwa mu ka ndi-ndum-ọdum na ndi-isim nēkpere; ọzọ, n'elu ala-ezem ka emerem ka m'nọzie, ọ bu kwa idi-uku nke kachasi ka atukwasirim. 37 Ub͕u a mu onwem, bú Nebukadneza, nāja, nēbuli, nāsọpuru Eze nke elu-igwe; n'ihi na ọlu-Ya nile bu ezi-okwu, uzọ-Ya nile bu kwa ikpé: ọzọ, ndi nējeghari na npako, Ọ puru ime ka ha di ala.

Daniel 5

1 Belshaza, bú eze, mere oké oriri nye nnù ndi-isi-ya abua na ọgu iri, ọ bu kwa n'iru nnù abua na ọgu iri ahu ka ọ nāṅu manya-vine. 2 Belshaza, mb͕e ọ nēdetu manya-vine ahu ire, ọ siri ka achita iko ọla-edo na ọla-ọcha nke Nebukadneza, bú nna-ya, chiputarari n'ulo uku Chineke nke di na Jerusalem; ka eze na ndi-isi-ya na ndi bu nwunye-ya na ndi-enyi-ya nwanyi we ṅua manya-vine nime ha. 3 Mb͕e ahu ha chitara iko ọla-edo nke achiputarari n'ulo uku nke ulo Chineke nke di na Jerusalem; eze na ndi-isi-ya na ndi bu nwunye-ya na ndi-iko-ya nwan yi we ṅua manya-vine nime ha. 4 Ha ṅuru manya-vine, we ja chi nile nke ọla-edo, na nke ọla-ọcha, na nke ọla, na nke ígwè, na nke osisi, na nke nkume. 5 N'otù oge hour ahu ka nkpisi-aka ufọdu nke aka madu putara, de ihe na ncherita-iru ihe-idọba-oriọna n'elu nzu etere na mb͕idi ulo uku eze: eze nāhu kwa ọbu-aka ahu nēde ihe. 6 Mb͕e ahu ib͕u-maramara nke iru eze b͕anwere, èchìchè-ya nile nēme kwa ka ọ ma jijij; nkwonkwo úkwù-ya nātọpusi kwa, ikperè-ya abua nākukọrita kwa onwe-ha. 7 Eze kpọsiri nkpu ike, si ka eme ka ndi-dibia na ndi Kaldea na ndi nekè elu-igwe bata. Eze zara, si ndi-amam-ihe nke Babilon, Onye ọ bula nke gāgu ihe a edere, kọ-kwa-ram isi-ya, uwe-ododo ka o gēyi, iyab͕a ọla-edo gādi kwa n'olu-ya, ọ bu kwa dika otù nime ndi-eze atọ n'ala-eze a ka ọ gāchi achi. 8 Mb͕e ahu ndi-amam-ihe nile nke eze batara: ma ha apughi igu ihe ahu edere, ma-ọbu ime ka eze mara isi-ya. 9 Mb͕e ahu eze, bú Belshaza, mara jijiji nke-uku, ib͕u-maramara nke iru-ya b͕anwe-kwa-ra n'aru ya, ọ nāb͕a kwa ndi-isi-ya ghari. 10 Ma eze-nwanyi were n'ihi okwu nile nke eze na ndi-isi-ya bata n'ulo oké oriri ahu: eze-nwanyi zara, si, Eze, di ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi; ka èchìchè-gi nile ghara ime ka i ma jijiji, ka ib͕u-maramara nke iru-gi ghara kwa ib͕anwe: 11 otù nwoke di n'ala-eze-gi, onye mọ nke chi nsọ nile di nime ya; ọzọ, n'ubọchi nna-gi ìhè na uche na amam-ihe, dika amam-ihe nke chi nile, ka ahuru nime ya: ọzọ, eze ahu, bú Nebukadneza, bú nna-gi, onye-isi nke ndi-ode-akwukwọ di nsọ na ndi-dibia na ndi Kaldea na ndi nēkè elu-igwe ka o doro ya, bú nna-gi, eze; 12 n'ihi na mọ nke kachasi, na ihe-ọmuma, na uche, na ikọ isi nrọ di iche iche, na ikọ isi okwu-omimi di iche iche, na itọsi okwu nke nāb͕a ghari, ka ahuru nime ya, bú Daniel, onye eze ahu guru aha-ya Belteshaza. Ub͕u a, ka akpọta Daniel, ọ gākọ kwa isi ihe a edere. 13 Mb͕e ahu emere ka Daniel ba n'iru eze. Eze zara, si Daniel, Ọ̀ bu gi onwe-gi bu Daniel ahu, onye bu otù nime umu ndi nke Juda emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ndi eze ahu, bú nnam, chiputara na Juda? 14 Ọzọ, anuwom ihe bayere gi, si na mọ nke chi nile di nime gi, na ahuwo kwa ìhè na uche na amam-ihe nke kachasi nime gi. 15 Ma ub͕u a emewo ka ndi mara ihe, bú ndi-dibia, bata n'irum, ka ha we gua ihe a edere, me ka m'mara isi-ya: ma ha apughi ikọ isi ihe a. 16 Ma mu onwem anuwo ihe bayere gi, si na i puru ikọ isi ihe nile na itọsi okwu nile nke nāb͕a ghari: ub͕u a, asi na i puru igu ihe a edere, na ime ka m'mara isi-ya, uwe-ododo ka i gēyi, iyab͕a ọla-edo gādi kwa n'olu-gi, ọ bu kwa dika otù nime ndi-eze atọ n'ala-eze a ka i gāchi achi. 17 Daniel zara, si n'iru eze, Ka onyinye-gi diri gi onwe-gi, gi nye kwa onye ọzọ ugwọ-ọlu-gi; ma m'gāguru eze ihe a edere, me ka ọ mara isi-ya. 18 Gi onwe-gi, eze, Chineke Nke kachasi ihe nile elu nyere Nebukadneza, bú nna-gi, ala-eze a na idi-uku na ebube na ima-nma: 19 ọ bu kwa n'ihi idi-uku ahu nke O nyere ya ka ndi nile di iche iche na mba nile na ndi nāsu asusu nile di iche iche nọ nāma jijiji nātu egwu n'iru ya: onye ọ nāchọ ib͕u ọ nēb͕u ya, onye ọ nāchọ idebe ndu ọ nēdebe ya ndu; onye ọ nāchọ ibuli ọ nēbuli ya, onye ọ nāchọ ime ka ọ di ala, ọ nēme ka ọ di ala. 20 Ma mb͕e obi-ya di elu, mb͕e mọ-ya di kwa ike ime ihe-nganga, emere ka o si n'oche-eze nke ala-eze-ya ridata, ọ bu kwa ebube-ya ka ewezugara n'ebe ọ nọ: 21 esi-kwa-ra n'ebe umu nke madu bi chupu ya, eme-kwa-ra obi-ya ka ọ di ka nke anu-ọhia, ọ bu kwa n'etiti inyinya-ibu-ọhia ka ebe-obibi-ya di; ihe-ọkukú ka anēme ka ọ ta dika ehi, igirigi nke elu-igwe nēde kwa aru-ya: rue mb͕e ọ mara na Chineke Nke kachasi ihe nile elu nāchi achi n'ala-eze nke madu, na ọ bu kwa onye ọ bula Ọ nāchọ ido onye-isi-ya ka Ọ nēdo. 22 Ma gi onwe-gi, bú nwa-ya, Belshaza, i meghi ka obi-gi di ala, ọ bu ezie na i mara ihe a nile; 23 ma ọ bu imegide Onye-nwe elu-igwe ka i buliworo onwe-gi; ọ bu kwa aria nile nke ulo-Ya ka ha chitaworo n'iru gi, gi onwe-gi na ndi-isi-gi na ndi bu nwunye-gi na ndi-iko-gi nwanyi nāṅu kwa manya-vine nime ha; ọ bu kwa chi nile nke ọla-ọcha, na nke ọla-edo, na nke ọla, na nke ígwè, na nke osisi, na nke nkume, nke nādighi-ahu uzọ, nke nādighi-anu kwa ihe, nke nādighi-ama kwa ihe, ka i jaworo: ma Chineke ahu Onye ume-gi di n'aka-Ya, Onye nwe-kwa-ra uzọ-gi nile, ka i nāsọpurugh: 24 mb͕e ahu ka esiri n'iru ya zilaga ọbu-aka ahu; ọ bu kwa ihe a nke edere ka akaworori. 25 Ma nka bu ihe-odide ahu nke akarari, MENE, MENE, TEKEL, UFASIN. 26 Nka bu akukọ-isi ihe ahu: MENE; Chineke agutawo ala-eze-gi ọnu, me ka mb͕e-ya ruzue. 27 TEKEL; atùwo gi n'ihe-ọtùtù, hu na ihe kọrọ nime gi. 28 PERES; ekewawo ala-eze-gi, nye ndi Midia na ndi Peasia. 29 Mb͕e ahu Belshaza kwuru okwu, ha we yibe Daniel uwe-ododo, yibe kwa ya iyab͕a ọla-edo n'olu-ya, kwusa okwu bayere ya, si na ọ gābu onye nāchi achi dika otù nime ndi-eze atọ n'ala-eze ahu. 30 N'abali ahu ka eb͕uru Belshaza, bú eze Kaldea. 31 Ma Daraiọs, bú onye Midia, natara ala-eze ahu mb͕e ọ b͕ara ihe ra ka ọgu arọ atọ na abua.

Daniel 6

1 Ọ di Daraiọs nma n'anya ido ọgu madu isi, bú ndi nọchiri anya eze, ka ha buru ndi-isi ala-eze-ya, ndi gānọ n'ala-eze ahu nile; 2 na ido ndi-isi atọ ndi-isi-ha, ndi Daniel bu otù nime ha; ka ndi ahu ndi nọchiri anya eze we nākọrọ ha akukọ ihe nile ha nēme, ka o we ghara kwa idi ihe nēfunari eze. 3 Mb͕e ahu Daniel nka ghọrọ ọkaka n'elu ndi-isi ahu na ndi ahu ndi nọchiri anya eze, n'ihi na mọ nke kachasi di nime ya; eze we zube ido ya onye-isi ala-eze-ya nile. 4 Mb͕e ahu ndi-isi ahu na ndi ahu ndi nọchiri anya eze nọ nāchọ ichọputa ihe-ebubo iji bo Daniel bayere ala-eze; ma ọ dighi ihe-ebubo maọbu omume bibiri ebibi ọ bula ha puru ichọputa; n'ihi na onye kwesiri ntukwasi-obi ka ọ bu, ọ dighi kwa nmehie ma-ọbu omume bibiri ebibi ọ bula achọputara n'aru ya. 5 Mb͕e ahu ndikom ndia nāsi, Ayi agaghi-achọputa ihe-ebubo iji bo Daniel nka, ma isi na ayi achọputaghi ya n'aru ya n'iwu nke Chineke-ya. 6 Mb͕e ahu ndi-isi ndia na ndi nọchiri anya eze ndia were oké nkpọtu b͕akọta n'ebe eze nọ, ọ bu kwa otú a ka ha nāsi ya, Daraiọs, bú eze, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi. 7 Ndi-isi ala-eze nile, na ndi-isi, na ndi nọchiri anya eze, na ndi-ndum-ọdu, na ndi nāchi achi, ab͕awo ìzù ime ka otù ukpuru eze guzosie ike, na ime ka otù isọ-nsọ di ike, na onye ọ bula nke gāriọ chi ọ bula ma-ọbu madu ọ bula aririọ rue orú ubọchi na iri, ma-ọbughi nání gi, eze, na agātubà ya n'olùlù ọdum. 8 Ub͕u a, eze, me ka isọ-nsọ a guzosie ike, kaye aha-gi n'ihe a edere n'akwukwọ, ka ewe ghara ib͕anwe ya, dika iwu nke Midia na Peasia si di, nke nādighi-agabiga. 9 N'ihi nka ka eze, bú Daraiọs, kayere aha-ya n'ihe ahu edere n'akwukwọ, na n'isọ-nsọ ahu. 10 Ma Daniel, mb͕e ọ mara na akayewo aha n'ihe ahu edere n'akwukwọ, o we bata n'ulo-ya: (ma o nwere window ufọdu ghere oghe n'ime-ulo-elu-ya chere iru na Jerusalem; ) ọ bu kwa ub͕ò atọ n'ubọchi ka ya onwe-ya nēb͕u ikperè-ya n'ala nēkpe ekpere, nēkele ekele n'iru Chineke-ya, n'ihi na otú a ka ọ nēmeri site na mb͕e gara aga. 11 Mb͕e ahu ndikom ndia were oké nkpọtu b͕akọta, chọputa Daniel ka ọ nāriọ aririọ, nāriọ kwa aririọ-amara n'iru Chineke-ya. 12 Mb͕e ahu ha biaruru nso, kwue okwu n'iru eze bayere isọ-nsọ eze, si: Ọ̀ dighi isọ-nsọ i kayere aha, na onye ọ bula nke gāriọ chi ọ bula ma-ọbu madu ọ bula aririọ rue orú ubọchi na iri, ma-ọbughi nání gi, eze, na agātubà ya n'olùlù ọdum? Eze zara, si, Ihe nke nēguzosi ike ka ihe a bu, dika iwu Midia na Peasia si di, nke nādighi-agabiga. 13 Mb͕e ahu ha zara, si n'iru eze, Daniel, onye bu otù nime umu ndi Juda emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ọ nughi olu-gi, eze, ma-ọbu isọ-nsọ ahu nke i kayeworo aha-gi, kama ub͕ò atọ n'ubọchi ka ọ nāriọ aririọ-ya. 14 Mb͕e ahu eze, mb͕e ọ nuru okwu a, ọ jọrọ njọ n'anya-ya nke-uku, ọ bu kwa Daniel ka ọ tukwasiri obi-ya idọputa ya: we rue ọdida anyanwu ka ọ nọ nējisi ike inaputa ya. 15 Mb͕e ahu ndikom ndia were oké nkpọtu b͕akọta n'ebe eze nọ, ha we si eze, Mara, gi eze, na iwu nke diri Midia na Peasia bu, na ọ dighi isọ-nsọ ọ bula ma-ọbu ukpuru ọ bula nke eze nēme ka o guzosie ike agāb͕anwe. 16 Mb͕e ahu eze kwuru, ha we me ka Daniel bia, ha we tubà ya n'olùlù ọdum. Eze zara, si Daniel, Chineke-gi, Onye gi onwe-gi nēfè mb͕e nile, Ya onwe-ya gādọputa gi. 17 Ewe bute otù nkume, tukwasi ya n'ọnu olùlù ahu; eze we were nb͕a-aka-akàrà-ya na nb͕a-aka-akàrà ndi-isi-ya ka ya; ka ewe ghara ib͕anwe ihe ezubere bayere Daniel. 18 Mb͕e ahu eze lara n'ulo uku ya, nọ ọnọdu-abali nēbu ọnu: achibatakwaghi ubọ egwú n'iru ya: ura-ya fepu-kwa-ra n'anya-ya. 19 Mb͕e ahu eze biliri n'isi-ututu, mb͕e chi bọrọ, o we were ọsọ garue olùlù ọdum. 20 Mb͕e ọ nābiaru nso olùlù ahu n'ijekuru Daniel, ọ bu olu dika nke onye ihe nēwuta ka o jiri ti nkpu: eze zara, si Daniel, Daniel, gi orù nke Chineke di ndu, Chineke-gi, Onye gi onwe-gi nēfè mb͕e nile, Ọ̀ puru idọputa gi n'aka ọdum? 21 Mb͕e ahu Daniel gwara eze okwu, si, Eze, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi. 22 Chinekem ezitewo mọ-ozi-Ya, we kpuchita ọnu ọdum ndia, ha emerughkwam aru: n'ihi na n'iru Ya ọ bu emeghi-ihe-ọjọ ka ahuru nimem; ọzọ kwa, n'iru gi, eze, ọ dighi ihe-imeru-aru m'meworo. 23 Mb͕e ahu ọ di eze nma n'anya nke-uku, o we si ka ha me ka Daniel rigoputa n'olùlù ahu. Ewe me ka Daniel si n'olùlù ahu rigota, ọ dighi kwa imeru-aru ọ bula ahuru n'aru-ya, n'ihi na ọ tukwasiri Chineke-ya obi. 24 Eze we kwue, ha we me ka ndikom ahu bia, bú ndi borori Daniel ebubo, ọ bu kwa n'olùlù ọdum ka ha tubàra ha na umu-ha na ndi bu nwunye-ha; ha akēruteghi kwa ala olùlù ahu tutu ọdum enwe ike n'aru ha, tapia ọkpukpu-ha nile. 25 Mb͕e ahu Daraiọs, bú eze, degara ndi nile di iche iche, na mba nile, na ndi nāsu asusu nile di iche iche, ndi bi n'uwa nka nile, akwukwọ-ozi, si; Ka udo-unu di uku. 26 Anēsite n'irum nye iwu, si, n'ebe nile ọ bula anāchi n'ala-ezem, ka madu nāma jijiji nātu egwu n'iru Chineke nke Daniel: N'ihi na Ya onwe-ya bu Chineke di ndu, Ọ nēguzosi kwa ike rue mb͕e nile ebighi-ebi, ala-eze-Ya bu kwa nke anāgaghi-emebi, ọchichi-Ya gādigide kwa rue ọgwugwu ihe nile: 27 Ọ bu Onye-ndọputa, na Onye-nnaputa, na Onye nēme ihe-iriba-ama di iche iche na ihe-iju-anya di iche iche n'elu-igwe na n'uwa; Onye dọputaworo Daniel n'aka ọdum. 28 Ihe ga-kwa-ra Daniel nka nke-ọma n'ọbubu-eze Daraiọs na n'ọbubu-eze Sairọs, bú onye Peasia.

Daniel 7

1 N'arọ mbu nke Belshaza, bú eze Babilon, Daniel huru nrọ na ọhù di iche iche nke isi-ya n'elu ihe-ndina-ya: mb͕e ahu nrọ ahu ka o dere n'akwukwọ, ọ bu isi ihe n'ihe nile ọ huru ka o kwuru. 2 Daniel zara, si, Anọm nāhu n'ọhùm n'abali, ma, le, ifufe anọ nke elu-igwe nēfekwasi oké osimiri uku si-ike. 3 Anu anọ nke di uku we nēsi n'oké osimiri rigoputa, ha di iche otù n'ibe-ya. 4 Nke-mbu di ka ọdum, ọ nwe-kwa-ra nkù abua nke ugo: anọm nēle rue mb͕e ekwopuru nkù-ya abua, ewe si n'ala bulie ya elu, ọ bu kwa n'ukwu abua ka eguzobere ya ọtọ dika madu, ọ bu kwa obi madu ka enyere ya. 5 Ma le, anu ọzọ, nke mere ha abua, nke yiri bear, ma n'otù akuku ka emere ya ka o bilie, ọgiriga atọ di kwa n'ọnu-ya n'etiti ezé-ya: ọ bu kwa otú a ka ha nāsi ya, Bilie, rie ọtutu anu. 6 Mb͕e nka gasiri, anọm nāhu, ma, le, anu ọzọ, dika agu, ma o nwere nkù anọ nke anu-ufe n'azu-ya; ọ bu kwa isi anọ ka anu a nwere; anēnye kwa ya ọchichi. 7 Mb͕e nka gasiri m'nọ nāhu n'ọhù nile nke abali, ma le, otù anu, nke mere ha anọ, nke di egwu, nwe ume, dikarisiri ike; ọ nwe-kwa-ra ezé di uku nke ígwè: o ripiara ihe tapia kwa, ma nke fọduru, o jiri ukwu-ya zọtọ ya: anu ahu di kwa iche n'anu nile buru ya uzọ; o nwe-kwa-ra mpi iri. 8 Anọm nēlegide mpi iri ahu, ma, le, otù mpi ọzọ, nke di ntà, rigotara n'etiti ha, ewe ropu mpi atọ nime mpi iri mbu n'iru ya: ma, le, anya di iche iche, dika anya madu, di na mpi a, na otù ọnu nke nēkwu oké ihe di iche iche. 9 Anọm nāhu rue mb͕e atudasari oche-eze di iche iche, otù Onye ochie we nọdu ala: uwe-Ya di ọcha dika snow, agiri-isi nke isi-Ya di kwa ka aji-anu nwupuru enwupu; oche-eze-Ya bu ire ọku ire ọku, wheel-Ya nile bu ọku nēre ere. 10 Osimiri nke bu ọku nērùputa n'iru ya: orú nnù ndi-ozi ọgu uzọ isi na uzọ ise nējere Ya ozi, orú nnù orú nnù uzọ, na orú nnù nnù uzọ iri-na-otù, na orú nnù ọgu uzọ ise, nēguzo kwa ọtọ n'iru Ya: Onye-ikpe ahu nọduru ala, asaghe-kwa-ra akwukwọ di iche iche. 11 Anọm nāhu na mb͕e ahu n'ihi olu nke oké okwu nile nke mpi nēkwu: anọm nāhu rue mb͕e eb͕uru anu ahu, la aru-ya n'iyì, rara ya nye nsure-ọku. 12 Ma anu atọ nke fọduru, emere ka ọchichi-ha gabiga: ma ogologo mb͕e na ndu-ha ka enyere ha rue mb͕e akara àkà na mb͕e. 13 Anọm nāhu n'ọhù nile nke abali, ma, le, otù onye, nke di ka nwa nke madu, nọ nābia n'igwe-oji nke elu-igwe, ọ bu kwa Onye ochie ahu ka ọ biakutere, ha we me ka ọ biarue nso n'iru Ya. 14 Ọ bu kwa ya ka enyere ọchichi, na ebube, na ala-eze, ka ndi nile di iche iche na mba nile na ndi nile nāsu asusu di iche iche we fè Ya: ọchichi-Ya bu ọchichi ebighi-ebi, nke nāgaghi-agabiga, ọ bu kwa ala-eze-Ya bu nke anāgaghi-emebi. 15 Ma mu onwem, bú Daniel, o wutara mọm nime ọbọ́-ya, ọhù nile nke isim nēme kwa ka m'ma jijiji. 16 Abiarurum nso otù onye nime ndi ahu nēguzo ọtọ n'ebe ahu, ọ bu kwa ihe bu ezi okwu bayere ihe a nile ka m'riọrọ n'aka ya. O we gwam okwu, ọ bu kwa isi ọhù ndia ka o mere ka m'mara, si: 17 Anu uku ndia, nke di anọ, bu eze anọ, ndi gēsi n'ala bilie ọtọ. 18 Ma ndi nsọ nke Onye ahu nke kachasi ihe nile elu gānata ala-eze ahu, nwe ala-eze ahu rue mb͕e ebighi-ebi, ọbuná rue mb͕e nile ebighi-ebi. 19 Mb͕e ahu ka m'chọrọ ima ihe bu ezi-okwu bayere anu nke-anọ ahu nke puru iche nime ha nile, nke dikarisiri egwu, nke ezé-ya nile bu ígwè, mbọ-ya nile buru ọla; nke ripiara, tapia, were ukwu-ya nile zọtọ nke fọduru; 20 achọ-kwa-ram ima ihe bu ezi-okwu bayere mpi iri ahu nke di n'isi-ya, na mpi ọzọ ahu nke rigotara, nke mpi atọ da-kwa-ra n'ala n'iru ya; ọbuná mpi ahu nke nwere anya di iche iche na ọnu nke nēkwu oké ihe di iche iche, nke di uku kari ibe-ya nile n'ile ya anya. 21 Anọm nāhu, mpi ahu we nēbuso ndi nsọ agha, nwe ike imegide ha; 22 rue mb͕e Onye ochie ahu biara, mb͕e ọ di kwa ikpé enyere ndi nsọ nke Onye ahu nke kachasi ihe nile elu: mb͕e ahu akara àkà rute-kwa-ra na ndi nsọ nwere ala-eze ahu. 23 Otú a ka ọ siri, Anu nke-anọ gābu ala-eze nke-anọ n'uwa, nke gāpu iche n'ala-eze nile, ọ gēripia kwa uwa nka nile, zọpia ya, tapia ya. 24 Ma mpi iri ndia, ọ bu n'ala-eze ahu ka eze iri gēsi bilie: eze ọzọ gēbili kwa n'azu ha; ma ya onwe-ya gāpu iche n'aru ndi buru ya uzọ, eze atọ ka ọ gēme kwa ka ha di ala. 25 Ọzọ, okwu di iche iche megide Onye ahu nke kachasi ihe nile elu ka o gēkwu, ọ bu kwa ndi nsọ nke Onye ahu nke kachasi ihe nile elu ka ọ gēme ka ha ka nká: ọ gēle kwa anya ib͕anwe mb͕e di iche iche akara àkà na iwu; agēnye kwa ha n'aka-ya rue otù oge na oge abua na nkera oge. 26 Ma Onye-ikpe ahu gānọdu ala, ọ bu kwa ọchichi-ya ka agēme ka ọ gabiga, ikpochapu ya na ila ya n'iyì rue ọgwugwu ihe nile. 27 Ma ala-eze ahu, na ọchichi ahu, na idi-uku nke ala-eze nile n'okpuru elu-igwe nile, ka agēnye ndi ahu, bú ndi nsọ nke Onye ahu nke kachasi ihe nile elu: ala-eze-Ya bu ala-eze ebighi-ebi, ọchichi nile gēfè kwa Ya, nu olu-Ya. 28 N'ebe a ka ọgwugwu okwu a di. Ma mu onwem, bú Daniel, èchìchèm nile nēme ka m'ma jijiji nke-uku, ib͕u-maramara nke irum nāb͕anwe kwa n'arum: ma okwu ahu ka m'debere n'obim.

Daniel 8

1 N'arọ nke-atọ nke ọbubu-eze nke Belshaza, bú eze, emere ka m'hu ọhù, bú mu onwem Daniel, mb͕e ọhù ahu nke emere ka m'hu ya n'isi-nmalite gasiri. 2 M'we hu n'ọhù ahu; o we rue, mb͕e m'nāhu, na mu onwem nọ na Shushan, bú ulo uku eze nke di n'Ilam, bú ala anāchi achi; m'we hu n'ọhù ahu, ma le, mu onwem nọ n'akuku osimiri Ulai. 3 M'we welie anyam, hu, ma, le, otù ebulu nēguzo n'iru osimiri ahu nke nwere mpi abua: mpi abua ahu di kwa elu, ma otù di elu kari ibe-ya: ma nke ka elu kpe azu pute. 4 Ahurum ebulu ahu ka ọ nāsọ mpi n'akuku Ọdida-anyanwu, na n'akuku Ugwu, na n'akuku Ndida; ma ọ dighi anu ọ bula nēguzo n'iru ya, ọ dighi kwa onye nānaputa ihe n'aka-ya; ma ọ neme dika ọ tọrọ ya utọ, me onwe-ya uku. 5 Ma mu onwem nọ nāchighari uchem, ma, le, otù nkpi siri n'Ọdida-anyanwu bia n'elu uwa nile, ma ọ dighi-emetu ala ma-ọli: nkpi ahu nwe-kwa-ra mpi juru anya n'olile n'etiti anya-ya abua. 6 O we biakute ebulu ahu nke nwere mpi abua, nke m'huru ka ọ nēguzo n'iru osimiri ahu, o we b͕akwasi ya ọsọ n'ọnuma nke ike-ya. 7 M'we hu ya ka ọ nābiarutu ebulu ahu nso, o we wesa ya iwe di ilu, tib͕ue ebulu ahu, sọjie mpi-ya abua; ike adighi kwa ebulu ahu iguzo n'iru ya, o we tuda ya n'ala, zọda ya ukwu; ọ dighi kwa onye nānaputa ebulu n'aka-ya. 8 Nkpi ahu we me onwe-ya uku ri nne: ma mb͕e o nwere ume, ab͕ajiri mpi uku ya; mpi anọ nke juru anya n'olile we pute n'ọnọdu ya chere iru n'ifufe anọ nke elu-igwe. 9 Ma otù nime ha ka otù mpi ntà siri puta, o we dikarisiri uku, n'uzọ Ndida, na n'uzọ Ọwuwa-anyanwu, na n'uzọ ala ahu mara nma. 10 O we di uku rue usu ihe nile nke elu-igwe; o we me ka ufọdu nime usu ihe nile nke elu-igwe na nime kpakpando da n'ala, o we zọda ha ukwu. 11 Ọbuná rue Onye-isi nke usu ahu ka o mere onwe-ya uku; ọ bu kwa n'aka-Ya ka ọ napuru àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, atuba-kwa-ra ọnọdu nke ebe nsọ Ya. 12 Anēnye kwa ya usu-ndi-agha imegide àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum n'ihi nmehie; o we tuda ezi-okwu n'ala, me ihe, ihe ga-kwa-ra ya. 13 M'we nu otù onye nsọ ka ọ nēkwu, otù onye nsọ we si onye ahu nke nēkwu okwu, Rùe ole mb͕e ka ọhù a gādi, bú nke àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na njehie ahu nke nākpata itọb͕ọrọ-n'efu, inye ma ebe nsọ ma usu-ndi-agha ka azọda ha ukwu? 14 O we sim, Rue nnù anyasi na ututu ise na ọgu iri-na-ise; ewe gua ebe nsọ n'ebe ezi omume. 15 O rue, mb͕e m'huru ọhù ahu, ọbuná mu onwem, bú Daniel, na m'chọrọ nghọta; ma, le, ihe di ka nwoke di ike n'ile ya anya nēguzo n'irum. 16 M'we nu olu madu n'etiti Ulai, o we kpọ, si, Gebriel, me ka onye a ghọta ọhùa. 17 O we bia nso n'ebe m'nēguzo; ma mb͕e ọ biara, m'we tua egwu nke-uku, da kpue irum n'ala: o we sim, Ghọta, gi nwa nke madu; n'ihi na mb͕e nke ọgwugwu ihe nile ka ọhù a diri. 18 Mb͕e ọ kpayerem uka, m'we di n'oké ura da kpue irum n'ala: o we metum aka, me ka m'guzo ọtọ n'ebe m'nēguzo. 19 O we si, Le, m'gaje ime ka i mara ihe ahu nke gādi n'ikpe-azu nke oké iwe a: n'ihi na ọ diri mb͕e akara àkà nke ọgwugwu ihe nile. 20 Ebulu ahu nke i huru, nke nwere mpi abua, ha bu eze nke Midia na Peasia. 21 Nkpi ahu nke nwere aji ri nne bu eze Jevan: ma mpi uku ahu nke di n'etiti anya-ya abua, nke ahu bu eze mbu. 22 Ma mpi ahu, nke b͕ajiri ab͕aji, nke mpi anọ guzoro n'ọnọdu-ya, ala-eze anọ gēsi na mba ahu guzo, ma ọ bughi n'ike-ya. 23 Ma na mb͕e ikpe-azu nke ala-eze-ha, mb͕e ndi-njehie gējehiezuwori, otù eze gēguzo ọtọ, nke nwere iru di ike, ọ bu kwa onye nāghọta okwu-omimi di iche iche. 24 Ike-ya gēsi kwa ike, ma ọ bughi n'ike nke aka ya; ọ gēbibi kwa n'uzọ di ebube, ihe gāga-kwa-ra ya nke-ọma, ọ gēme kwa ihe: ọ gēbibi kwa ndi nwere ume na ndi ahu, bú ndi nsọ. 25 Ọ gēsite kwa n'ezi uche-ya me ka aghughọ ga nke-ọma n'aka-ya; ọ bu kwa n'obi-ya ka ọ gēme onwe-ya uku; ọ bu kwa na mb͕e udo-ha ka ọ gēbibi ọtutu madu: ọ bu kwa imegide onye-isi nke ndi-isi ka ọ gēguzo; ma agāb͕aji ya nējighi aka. 26 Ma ọhù ahu nke anyasi na ututu nke ekwuworo, ezi-okwu ka ọ bu: ma gi onwe-gi zobe ọhù ahu; n'ihi na ọ diri ọtutu ubọchi di n'iru. 27 Ma mu onwem, bú Daniel, ike gwurum, m'we ria ọria ubọchi ufọdu; m'we bilie, je ozi eze: ọhù ahu ju-kwa-ram anya, ma ọ dighi onye nāghọta ya.

Daniel 9

1 N'arọ mbu nke Daraiọs nwa Ahasuerọs, onye sitere na nkpuru ndi Midia, onye emere eze nke ala-eze ndi Kaldea; 2 n'arọ mbu nke ọbubu-eze-ya ka mu onwem, bú Daniel, jiri akwukwọ nile ayi ghọta ọnu-ọgugu arọ ahu, nke okwu Jehova ruru Jeremaia, bú onye-amuma, nti bayere ha, imezuru nkpọnkpọ ebe nile nke Jerusalem, bú ọgu arọ atọ na iri. 3 M'we che Onye-nwe-ayi Chineke irum, ichọ Ya n'ekpere na aririọ-amara di iche iche, n'obubu-ọnu na ákwà-nkpe na ntu. 4 M'we kpere Jehova, bú Chinekem, kwuputa, si, Biko, Onye-nwe-ayi, bú Chineke ahu Nke di uku di kwa egwu, Onye nēdebere ndi nāhu Ya n'anya, ndi nēdebe kwa ihe nile O nyere n'iwu, ọb͕ub͕a-ndu-Ya na ebere-Ya; 5 ayi emehiewo, me ajọ omume, mebie iwu, nupu isi, we si n'ihe nile I nyere n'iwu na n'ikpé-Gi nile wezuga onwe-ayi: 6 ayi egeghi kwa nti ndi-orù-Gi, bú ndi-amuma, ndi gwara ndi-eze-ayi na ndi-isi-ayi na nna-ayi-hà, gwa kwa ndi nile nke ala-ayi, okwu n'aha-Gi. 7 Onye-nwe-ayi, Gi ka ezi omume diri, ma ayi ka ihere iru diri, dika o si di ta; ọ diri ndi Juda, di-kwa-ra ndi bi na Jerusalem, di-kwa-ra Israel nile, ma ndi nọ nso, ma ndi nọ n'ebe di anya, n'ala nile ebe I chugaworo ha, n'ihi nmekpu-ha nke ha mekpuru Gi. 8 Onye-nwe-ayi, ayi ka ihere iru diri, ọ diri ndi-eze-ayi, di-kwa-ra ndi-isi-ayi, di-kwa-ra nna-ayi-hà, n'ihi na ayi emehiewo megide Gi. 9 Onye-nwe-ayi Chineke-ayi ka obi-ebere nile na nb͕aghara nile diri; n'ihi na ayi anupuwo isi n'okpuru Ya; 10 ayi egeghi kwa olu Jehova, bú Chineke-ayi, nti, ijeghari n'iwu-Ya nile, nke O tiyere n'iru ayi site n'aka ndi-orù-Ya, bú ndi-amuma. 11 E, Israel nile agabigawo iwu-Gi, we wezuga onwe-ha, ka ha we ghara ige olu-Gi nti: ewe wukwasi ayi ọb͕ub͕a-ayi ahu na ọṅuṅu-ayi ahu nke edeworo n'akwukwọ iwu Moses, bú orù Chineke; n'ihi na ayi emehiewo megide Ya. 12 O we me ka Okwu-Ya nile guzosie ike, bú nke O kwuru megide ayi, megide kwa ndi-ikpe-ayi ndi kpere ayi ikpe, n'ime ka ihe ọjọ uku biakwasi ayi: n'ihi na emeghi n'okpuru elu-igwe nile otú emeworo na Jerusalem. 13 Dika edeworo ya n'akwukwọ iwu Moses, ihe ọjọ a nile abiakwasiwo ayi: ma ayi emeghi ka iru Jehova, bú Chineke-ayi, dajua, ka ayi we si n'ajọ omume nile ayi chigharia, nwe uche n'ezi-okwu-Gi. 14 Jehova we mua anya n'ebe ihe ọjọ ahu di, me ka ọ biakwasi ayi: n'ihi na Onye ezi omume ka Jehova, bú Chineke-ayi, bu bayere ọlu-Ya nile nke Ọ luworo, ma ayi egeghi olu-Ya nti. 15 Ma ub͕u a, Onye-nwe-ayi Chineke-ayi, Onye wereworo aka di ike me ka ndi-Gi si n'ala Ijipt puta, I we mere Onwe-gi aha, dika o si di ta; ayi emehiewo, ayi emebiwo iwu. 16 Onye-nwe-ayi, dika ezi omume-Gi nile si di, biko, ka iwe-Gi na ọnuma-Gi si n'obodo-Gi, bú Jerusalem, bú ugwu nsọ Gi, laghachi: n'ihi na ọ bu n'ihi nmehie nile ayi, na n'ihi ajọ omume nile nke nna-ayi-hà, ka Jerusalem na ndi-Gi ghọworo ihe-ita-uta nye ndi nile di ayi buruburu. 17 Ma ub͕u a, Chineke-ayi, ge nti n'ekpere orù-Gi na n'aririọ-amara-ya nile, me iru-Gi ka ọ mukwasi ebe nsọ Gi nke tọb͕ọrọ n'efu, n'ihi Onye-nwe-ayi. 18 Chinekem, tọ nti-Gi n'ala, nu; saghe anya-Gi abua, hu ebe nile ayi nke tọb͕ọrọ n'efu, na obodo ahu nke akpọkwasiworo ya aha-Gi: n'ihi na ọ bughi n'ihi ezi omume nile ayi ka ayi onwe-ayi nēme ka aririọ-amara nile ayi da n'iru Gi, kama n'ihi ọtutu obi-ebere-Gi. 19 Onye-nwe-ayi, nuru: Onye-nwe-ayi, b͕aghara: Onye-nwe-ayi, ṅa nti me ihe: anọla ọdu: n'ihi Gi onwe-gi; Chinekem, n'ihi na aha-Gi ka akpọkwasiworo obodo-Gi na ndi-Gi. 20 Ma mb͕e mu onwem nọ nēkwu okwu, nēkpe ekpere, nēkwuputa nmehiem na nmehie ndim, bú Israel, nēme ka aririọ-amaram da n'iru Jehova, bú Chinekem, n'ihi ugwu nsọ nke Chinekem; 21 e, mb͕e mu onwem nọ nēkwu okwu n'ekpere, onye ahu, bú Gebriel, onye m'hururi n'ọhù n'isi-nmalite, ebe emere ka o feb͕ue onwe-ya n'ufe, o we nērutum aru n'ihe dika mb͕e onyinye-inata-iru-ọma nke anyasi. 22 O we me ka m'ghọta, kpayerem uka, si, Daniel, ub͕u a ka m'putaworo ime ka i nwe uche ighọta ihe. 23 N'isi-nmalite aririọ-amara-gi nile ka okwu putara, mu onwem abiawo kwa igosi gi; n'ihi na ihe anāchọsi ike nke-uku ka i bu: ya mere tugharia uche n'okwu a, ghọta ọhù a. 24 Ọgu ízù atọ na iri, bú ízù ubọchi asa, ka ekpeworo n'ikpe bayere ndi-gi, baye-kwa-ra obodo nsọ gi, ime ka njehie bìe, na ime ka nmehie gwusia, na ikpuchi ajọ omume, na ime ka ezi omume ebighi-ebi bata, na ikachita ọhù na omuma akàrà, na ite Onye nsọ ahu Nke kachasi ndi nsọ nile manu. 25 Ma mara, were kwa uche mata, na site na nputa okwu ahu iwughachi na iwuzi Jerusalem rue mb͕e onye etere manu, bú onye-ndú, gādi ízù asa: na ọgu atọ na abua, agēwuzi kwa ya ọzọ, ya na amá na ékpè, ọbuná na nkpà nke mb͕e ndia. 26 Ma mb͕e ọgu ízù atọ na abua ahu gasiri agēbipu onye etere manu, ọ dighi kwa ihe ọ gēnwe: ọ bu kwa obodo ahu na ebe nsọ ahu ka ndi nke otù onye-ndú nke gaje ibia gēbibi; ma ọgwugwu-ya gādi na nrubiga-ókè dika nke miri, ọ bu kwa rue ọgwugwu mb͕e ahu ka agha gādi; ihe akara àkà bu itọb͕ọrọ-n'efu di iche iche. 27 Ọ gēme kwa ka otù ọb͕ub͕a-ndu siere ọtutu madu ike otù ízù: ọ bu kwa na nkera ízù ahu ka ọ gēme ka àjà na onyinye-inata-iru-ọma kwusi; ọ bu kwa n'elu nkù ihe-árú di iche iche ka otù onye nke nākpata itọb͕ọrọ-n'efu gābia: ọ bu kwa rue mb͕e agāwukwasi ngwusi na ihe akara àkà n'aru onye ahu nākpata itọb͕ọrọ-n'efu.

Daniel 10

1 N'arọ nke-atọ nke Sairọs, bú eze Peasia, ekpughere Daniel, onye akpọrọ aha-ya Belteshaza, okwu; ọ bu kwa ezi-okwu ka okwu ahu bu, ọbuná obubu-agha uku: o we ghọta okwu ahu, nghọta di-kwa-ra ya n'ọhù ahu. 2 N'ubọchi ahu mu onwem, bú Daniel, nọ nēru újú ogologo ízù atọ. 3 Nri anāchọsi ike nke-uku ka m'nērighi, anu na manya-vine abàghi kwa n'ọnum, eteghkwam onwem manu maọli, rue mb͕e ogologo ízù atọ ruzuru. 4 Ma n'ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa mbu, mb͕e mu onwem nọ n'akuku osimiri uku ahu, ya bu Hidekel, 5 m'we welie anyam abua, hu, ma, le, otù onye yiri uwe ọcha, onye ekere ihe-ọkiké ọla-edo ọma nke Ufaz n'úkwù-ya: 6 aru-ya di kwa ka beryl, iru-ya di kwa ka àmùmà si di n'ile ya anya, anya-ya abua di kwa ka ọwa nēnwu ọku, ogwe-aka-ya abua na ukwu-ya abua di kwa ka ib͕u-maramara nke ọla akwọchara akwọcha, olu okwu-ya nile di kwa ka olu ìgwè madu. 7 Mu onwem, bú Daniel, náním, huru ọhù ahu: ma ndikom ahu ndi mu na ha nọ ahughi ọhù ahu; ma otù ọ di, oké ọma-jijiji dakwasiri ha, ha we b͕alaga izobe onwe-ha. 8 Mu onwem we fọduru náním, m'we hu ọhù uku a, ike we ghara ifọdu nimem: n'ihi na ebubem b͕anwere ghọ ihe-nbibi n'arum, m'we ghara inagide ike ọ bula. 9 M'we nu olu okwu-ya nile: ma mb͕e m'nuru olu okwu-ya nile mu onwem adawori n'oké ura kpue irum n'ala, irum we che n'ala. 10 Ma, le, otù aka meturum, me ka m'guzo nāṅaghari n'elu ikperèm abua na ọbu-akam abua. 11 O we sim, Daniel, onye bu ihe anāchọsi ike nke-uku, ghọta okwu nile nke mu onwem nāgwa gi, gi guzo kwa ọtọ n'ebe-nguzo-gi; n'ihi na ub͕u a ka ezìworom biakute gi: mb͕e ọ kpayerem uka nka, m'we guzo ọtọ nāma jijiji. 12 O we sim, Atula egwu, Daniel; n'ihi na site n'ubọchi mbu ahu mb͕e i nyere obi-gi ighọta ihe na iweda onwe-gi n'ala n'iru Chineke-gi, anuru okwu-gi nile: mu onwem abiawo kwa n'ihi okwu-gi nile. 13 Ma onye-isi ala-eze Peasia nēguzo na ncherita-irum orú ubọchi na otù; ma, le, Maikael, bú otù nime ndi-isi ndi bu isi, biara iyerem aka: mu onwem we fọdu n'ebe ahu n'akuku ndi-eze Peasia. 14 Ma abiawom ime ka i ghọta ihe ahu nke gādakwasi ndi-gi na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia: n'ihi na ọhù fọduru nke diri ubọchi ndia. 15 Mb͕e ọ kpayerem uka dika okwu ndia si di, m'we che irum n'ala, da ob͕i. 16 Ma, le, otù onye nke di ka oyiyi umu nke madu nēmetu eb͕ub͕ere-ọnum abua aka: m'we saghe ọnum, kwue okwu, si onye ahu nke nēguzo na ncherita-irum, Onye-nwem, site n'ọhù a aru-ufum nile dakwasirim na mberede, m'we ghara inagide ike ọ bula. 17 Òrù nke onye-nwem nka gēsi kwa aṅa nwe ike ikpayere onye-nwem nka uka? ma mu onwem, site n'ub͕u a ike adighi-eguzogide kwa nimem, ume afọdughi kwa nimem. 18 Otù onye nke di ka madu n'ile ya anya we metukwam aka ọzọ, me ka m'di ike. 19 O we si, Atula egwu, gi onye bu ihe anāchọsi ike nke-uku: udo diri gi, di ike, e, di ike. Mb͕e ọ kpayerem uka, m'we me onwem ka m'di ike, si, Ka onye-nwem kwue; n'ihi na i mewo ka m'di ike. 20 O we si, Ì mara ihe m'jiri biakute gi? ma ub͕u a m'gālaghachi ibuso onye-isi Peasia agha: ma mb͕e mu onwem nāpu, le, onye-isi Jevan gābata. 21 Ma otú ọ di, m'gēgosi gi ihe akara àkà n'ihe edere n'akwukwọ nke ezi-okwu: ma ọ dighi otù onye nēme onwe-ya ka ọ di ike n'akukum imegide ndia, ma-ọbughi nání Maikael, bú onye-isi ūnu.

Daniel 11

1 Ma mu onwem, n'arọ mbu nke Daraiọs, bú onye Midia, nguzo-ọtọm bu ka m'ghọrọ ya onye nējidesi ike na ebe siri ike. 2 Ma ub͕u a ezi-okwu ka m'gēgosi gi. Le, ndi-eze atọ ọzọ ganēguzoro Peasia ọtọ; ma nke-anọ gābu ọgaranya nwe àkù uku kari ha nile: ma mb͕e emere ka ọ di ike site n'àkù-ya, ọ gākpọte ndi-ya nile imegide ala-eze Jevan. 3 Ma otù eze, onye bu dike, gēguzo ọtọ, ọ gāchi kwa achi n'oké ọchichi, me ka o si tọ ya. 4 Ma mb͕e o guzoro ọtọ, agētipia ala-eze-ya, kesa ya na nchere-iru ifufe anọ nke elu-igwe; ma ọ gaghi-adiri umu-ya gānọchi ya, ọ gaghi-adi kwa ka ala-ọchichi-ya nke ọ chiri si di; n'ihi na agēropu ala-eze-ya, ọ gādi-kwa-ra ndi ọzọ nābughi ndia. 5 Ma eze nke Ndida gādi ike, ya na otù nime ndi-isi-ya; ọ gādi kwa ike n'elu ya, chia achi; oké ala-ọchichi ka ala-ọchichi-ya gābu. 6 Ma n'ọgwugwu arọ ufọdu ha gēkekọta onwe-ha; ada eze nke Ndida gābiakute kwa eze Ugwu idozi okwu n'uzọ ziri ezi: ma nwanyi ahu agaghi-anagide ike nke ogwe-aka-ya; nwoke ahu agaghi-eguzogide kwa, ya na ogwe-aka-ya; ma agārara nwanyi ahu nye, ya onwe-ya, na ndi nēme ka ọ bia, na nna muru ya, na nwoke nke nēme ka ọ di ike na mb͕e ahu nile. 7 Ma otù onye gēsi n'ome nke nkpọrọgwu nwan yi ahu nile guzo ọtọ n'ọnọdu nwoke ahu, biakute usu-ndi-agha-ya, bata n'ebe siri ike nke eze Ugwu, megide ha, ghọ onye di ike: 8 ọzọ kwa, chi nile ha, ha na arusi nile ha akpuru akpu, tiyere ihe nile ha anāchọsi ike nke-uku nke ọla-ọcha na nke ọla-edo, ka ọ gādọta n'agha bata n'Ijipt; ma ya onwe-ya gēguzo arọ ufọdu ghara imegide eze Ugwu ahu. 9 Ọ gābata kwa n'ala-eze nke eze Ndida, ma ọ gālaghachi n'ala nke aka ya. 10 Ma umu-ya ndikom gākpali onwe-ha ibu agha, ha gāchikọta kwa ìgwè ọtutu usu-ndi-agha, ọ gābia abia, rubiga ókè dika osimiri, gabiga: ọ gālaghachi kwa, ha gākpali kwa onwe-ha ibu agha rue ebe-ya siri ike. 11 Ma eze Ndida gēwe iwe di ilu, puta, buso ya agha, bú eze Ugwu ahu: ọ gēguzo kwa oké ìgwè madu, ma agēnye ìgwè madu ahu n'aká-ya. 12 Agāchipu kwa ìgwè madu ahu, obi-ya ewe di elu: ọ gēme kwa ka nnù kwuru nnù madu da ada, ma ọ gaghi-adi ike. 13 Ma eze Ugwu ahu gēguzobe kwa ìgwè madu ọzọ bara uba kari ìgwè mbu; ọ bu kwa n'ọgwugwu mb͕e ndia, bú nke arọ ndia, ka ọ gābia abia, chiri usu-ndi-agha di uku, chi kwa ọtutu àkù. 14 Ma na mb͕e ahu ka ọtutu madu gēguzo ọtọ imegide eze Ndida: ọzọ, umu nke ndi nēme ihe-ike n'etiti ndi-gi gēbuli onwe-ha ime ka ọhù ahu guzo; ma ha gāsu ngọngọ. 15 Eze Ugwu ahu gābia kwa, wukọta obo-ihe, were otù obodo nke ewusiri ike nke-uku: ogwe-aka nile nke Ndida agaghi-eguzo kwa, ha na ndi ọ rọputara, ọ dighi kwa ike ọ bula ha nwere iguzo. 16 Ma onye ahu nke nābiakute ya gēme ka o si tọ ya, ọ dighi kwa onye ọ bula ganēguzo n'iru ya; ọ gēguzo kwa n'ala ahu mara nma, ngwusi gādi kwa n'aka-ya. 17 Ọ gēdo kwa iru-ya ibia abia n'ike nke ala-eze-ya nile, ndi ziri ezi gēso kwa ya; ọ gēme kwa ihe: ọ bu kwa ada ndinyom ka ọ gēnye ya, ibibi ya; ma ihe ahu agaghi-eguzo, ọ bughi kwa nke ya ka ọ gābu. 18 Ọ gēchighari kwa iru-ya le agwe-etiti nile, were ọtutu: ma otù ọchi-agha gēme ka ita-uta-ya kwusiri ya; e, ọ gēme kwa ka ita-uta-ya laghachikute ya. 19 Ọ gēchighari kwa iru-ya le ebe nile siri ike nke ala nke aka ya: ma ọ gāsu ngọngọ da, agaghi-ahu kwa ya. 20 Ma otù onye nke nēme ka onye nke nāchi n'ihe-ike gabiga n'ima-nma ala-eze ahu gēguzo ọtọ n'ọnọdu-ya: ma n'ubọchi ole-na-ole ka agētipia ya, ma ọ bughi n'iwe, ọ bughi kwa n'agha. 21 Ma otù onye eledara anya gēguzo ọtọ n'ọnọdu-ya, onye ha nātukwasighi ebube nke ala-eze: ma ọ gābata nime na mb͕e udo, were ire-utọ nile nata ala-eze ahu. 22 Ma ogwe-aka nile nke nrubiga-ókè ahu ka agēji ruchapu ha n'iru ya, tipia ha; e, onye-ndú nke ọb͕ub͕a-ndu kwa. 23 Ma site na mb͕e madu kekọtara onwe-ha n'ebe ọ nọ ọ gālu ọlu aghughọ: ọ gēji kwa otù mba di nta rigo n'elu, nwe ume. 24 Na mb͕e udo na imegide ebe nile di urù nke ala anāchi achi ka ọ gābia; ọ gēme kwa ihe nke nna-ya-hà na ndi bu nna nna-ya-hà nēmeghi; ihe-nluta-n'agha na ihe-nkwata na àkù ka ọ gēkesara ha: ọ bu kwa imegide ebe di iche iche ewusiri ike ka ọ gēchè èchìchè-ya nile, ọbuná rue mb͕e akara àkà. 25 Ọ gākpọte kwa ike-ya na obi-ya imegide eze Ndida chiri oké usu-ndi-agha; eze Ndida gākpali kwa onwe-ya ibu agha chiri oké usu-ndi-agha nke di ike nke-uku: ma ọ gaghi-eguzo, n'ihi na ha gēchè èchìchè di iche iche imegide ya. 26 Ọzọ, ndi nēri ihe-oriri ọma ya gētipia ya, usu-ndi-agha-ya gērubiga ókè dika miri: ọtutu madu gāda kwa n'ala buru ndi eb͕uru eb͕u. 27 Ma eze abua ndia, obi-ha gādi n'ime ihe ọjọ, ọ bu kwa n'otù table ka ha gēkwu okwu-ugha: ma ọ gaghi-aga nke-ọma; n'ihi na ọgwugwu fọduru idi na mb͕e akara àkà. 28 Ọ gālaghachi kwa n'ala-ya n'àkù uku; obi-ya gābu kwa imegide ọb͕ub͕a-ndu nsọ; ọ gēme kwa ihe, laghachi n'ala-ya. 29 Na mb͕e akara àkà ka ọ gābiaghachi, ba na Ndida; ma ọ gaghi-adi na mb͕e ikpe-azu otù ọ diri na mbu. 30 Ma ub͕ọ Kitim gābia imegide ya; obi-ya ewe mebie emebi, o we laghachi, wesa ọb͕ub͕a-ndu nsọ ahu oké iwe, me ihe, laghachi, tugharia uche na ndi nārapu ọb͕ub͕a-ndu nsọ ahu. 31 Ogwe-aka ufọdu gēsite kwa n'akuku-ya guzo, me ka ebe nsọ ahu ghara idi nsọ, bú ebe ahu siri ike, ha gēwezuga kwa àjà-nsure-ọku ahu anēsure mb͕e dum, ha gēdo kwa ihe-árú nke nākpata itọb͕ọrọ-n'efu. 32 Ọ bu kwa ndi nēmebi iwu megide ọb͕ub͕a-ndu ahu ka ọ gēmeru site n'ire-utọ di iche iche: ma ndi ahu nke mara Chineke-ha gādi ike, me ihe. 33 Ọzọ, ndi nwere uche n'etiti ndi Chineke gēme ka ọra madu ghọta ihe: ma ha gāsu ngọngọ site na mma'agha, site kwa n'ire-ọku, site kwa na ndọta-n'agha, site kwa na nluta-n'agha, ọtutu ubọchi. 34 Ma mb͕e ha nāsu ngọngọ agēyere ha aka nke-ntà: ma ọtutu madu gēji ire-utọ di iche iche rapara ha n'aru. 35 Ọzọ, ufọdu nime ndi ahu nwere uche gāsu ngọngọ, inucha ha, na ime ka ha di ọcha, na ime ka ha nwue ọcha, rue mb͕e ọgwugwu ihe ndia: n'ihi na ọ fọduru idi na mb͕e akara àkà. 36 Eze ahu gēme kwa ka o si tọ ya; ọ gēbuli kwa onwe-ya, me onwe-ya uku n'elu chi nile ọ bula, ọ bu kwa Chineke nke chi nile ka ọ gēkwu oké okwu di iche iche megide: ọ gāga-kwa-ra ya nke-ọma rue mb͕e oké iwe gāgwusi; n'ihi na ihe akara àkà gēme. 37 Ma ọ gaghi-atughari uche na chi nile nke nna-ya-hà, ma-ọbu n'ihe ahu ndinyom nāchọsi ike, ọ bu kwa na chi nile ọ bula ka ọ nāgaghi-atughari uche: n'ihi na n'elu ihe nile ka ọ gēme onwe-ya uku. 38 Ma ọ bu chi nke ebe nile siri ike ka ọ gāsọpuru n'ọnọdu-ya: ọ bu kwa chi nke nna-ya-hà nāmaghi ka o gēji ọla-edo, ji kwa ọla-ọcha, ji kwa nkume di oké ọnu-ahia, ji kwa ihe di iche iche anāchọsi ike, sọpuru. 39 Ọ gēmeso kwa ebe nile ewusiri ike nke ebe nile siri ike site n'iye-aka chi ala ọzọ: onye ọ matara gēme ka nsọpuru-ya ba uba; ọ gēme kwa ka ha chia ọra madu, ọ bu kwa ala ka ọ gēkè n'ọnu-ahia. 40 Ma na mb͕e nke ọgwugwu ihe ndia eze Ndida gāmalite isọ ya mpi: eze Ugwu ewe dakwasi ya dika oké ifufe, chiri ub͕ọ-ala, chiri kwa ndi-inyinya, chiri kwa ọtutu ub͕ọ; ọ gābà kwa n'ala-ya nile, rubiga ókè dika miri, gabiga. 41 Ọ gābà kwa n'ala ahu mara nma, ọ di kwa ọtutu ala gāsu ngọngọ: ma ndia ka agēme ka ha wepuga onwe-ha n'aka-ya: Edom, na Moab, na ndi-isi n'umu Amon. 42 Ọ gēsetipu kwa aka-ya imegide ala nile: ala Ijipt agaghi-aghọ kwa ndi nāb͕apu ab͕apu. 43 Ma ọ gēnwe ike n'àkù nile nke ọla-edo na ọla-ọcha, na n'ihe nile anāchọsi ike nke Ijipt: ndi Libia na ndi Etiopia gēso kwa na nzọ-ukwu-ya nile. 44 Ma ihe di iche iche anuru site n'Ọwuwa-anyanwu, site kwa n'Ugwu, gēme ka ọ ma jijiji: ọ gēji kwa oké ọnuma pua ikpochapu na iwezuga ọtutu madu ka ebibie ha. 45 Ọ gāma kwa ulo-ikwū nile nke ulo uku ya n'etiti oké osimiri nile na ugwu nsọ ahu mara nma; ma ọ gābiaru ọgwugwu-ya, ọ dighi kwa onye ganēyere ya aka.

Daniel 12

1 Ma na mb͕e ahu ka Maikael gēguzo ọtọ, bú onye-isi uku ahu nke nēguzo n'akuku umu ndi-gi: mb͕e ahuhu gādi kwa, nke mb͕e di otú ahu nādighi site na mb͕e mba ọ bula malitere idi rue mb͕e ahu: ma na mb͕e ahu ka agēme ka ndi-gi wepuga onwe-ha, bú onye ọ bula agāhu na edeworo aha-ya n'akwukwọ. 2 Ọzọ, ọtutu madu nime ndi nāraru ura n'ala, bú ájá, gēteta, ufọdu ibà na ndu ebighi-ebi, ufọdu ibà n'ita-uta riri nne na oyi agāsọ ha nke-uku mb͕e ebighi-ebi. 3 Ma ndi ahu ndi nwere uche ganēnwu ọcha dika onwunwu-ọcha nke mbara-ígwé; ndi nēme ọra madu ka ha ghọ ndi ezi omume ganāmu kwa dika kpakpando rue mb͕e nile ebighi-ebi. 4 Ma gi onwe-gi, Daniel, zobe okwu ndia, kachita kwa akwukwọ a akàrà, rue mb͕e ọgwugwu ihe ndia: ọtutu madu ganējeghari, ihe-ọmuma gāba kwa uba. 5 M'we hu, mu onwem, bú Daniel, ma, le, abua ọzọ nēguzo, otù onye n'otù usọ osimiri ahu, ibe-ya n'usọ osimiri nke-ọzọ. 6 Otù nime ha we si onye ahu nke yiri uwe ọcha, nke nọ n'elu miri nke osimiri ahu, Rùe ole mb͕e ka ọgwugwu oké ọlu ndia gādi? 7 M'we nu onye ahu nke yiri uwe ọcha, onye nọ n'elu miri nke osimiri ahu, o we welie aka-nri-ya na aka-ekpe-ya n'elu-igwe, were Onye ahu Nke nādi ndu mb͕e ebighi-ebi, si, na ọ gādiru otù mb͕e akara àkà, na mb͕e abua akara àkà, na nkera mb͕e akara àkà; ma mb͕e agāb͕ajisi aka nke ndi nsọ ahu, ihe nile ndia gāgwusi. 8 Mu onwem we nu, ma adighm-aghọta: m'we si, Onye-nwem, Gini bu mb͕e ikpe-azu nke ihe ndia? 9 O we si, La, Daniel: n'ihi na ezobewo okwu ndia, kachita kwa ha akàrà, rue mb͕e ọgwugwu ihe ndia. 10 Ọtutu madu gēme onwe-ha ka ha di ọcha, ha gēme onwe-ha ka ha nwue ọcha, agānucha kwa ha; ma ndi nēmebi iwu gēmebi iwu; ndi nile nke nēmebi iwu agaghi-aghọta kwa ihe: ma ndi ahu ndi nwere uche gāghọta. 11 Ma site na mb͕e agēwezuga àjà-nsure-ọku ahu anēsure mb͕e dum, mb͕e agēdo ihe-árú nke nākpata itọb͕ọrọ-n'efu, nnù ubọchi atọ na ọgu ubọchi anọ na iri gādi. 12 Onye ihe nāgara nke-ọma ka onye ahu bu nke nēchere, we biarute nnù ubọchi atọ na ọgu isi na iri na ise ahu. 13 Ma gi onwe-gi, la, rue ọgwugwu ihe ndia: i gēzu kwa ike, guzo ọtọ n'ebe ekeworo nye gi, n'ọgwugwu ubọchi ndia.

Hosea 1

1 Okwu Jehova nke ruru Hosea nwa Beeri nti n'ubọchi Uzaia na Jotam na Ehaz na Hezekaia, bú ndi-eze Juda, na n'ubọchi Jeroboam nwa Joash, bú eze Israel. 2 Isi-nmalite nke ikwu-okwu Jehova n'ọnu Hosea. Jehova we si Hosea, Je, luru n'onwe-gi nwunye nke nākwa iko na umu amuru n'ikwa-iko: n'ihi na ala nka nākwa iko nke-uku, ghara iso Jehova. 3 O we je luru Gomea nwa-nwayi Diblaim; owe turu ime, mutara ya nwa-nwoke. 4 Jehova we si ya, Kpọ aha-ya Jezreel; n'ihi na ọ fọduru nwa mb͕e ntà, M'gēwere ọbara Jezreel leta ulo Jihu, M'gēme kwa ka ala-eze ulo Israel kwusi. 5 Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na M'gāb͕aji uta Israel nime ndagwurugwu Jezreel. 6 O we turu ime ọzọ, mua nwa-nwanyi. Jehova we si Hosea, Kpọ aha-ya Lo-ruhama: n'ihi na M'gaghi-enwe kwa obi-ebere n'aru ulo Israel ọzọ, ka M'we bupuru ha nmehie-ha ma-ọli. 7 Ma n'aru ulo Juda ka M'gēnwe obi-ebere, M'gēji kwa Jehova, bú Chineke-ha, zọputa ha, ma M'gaghi-eji uta, ma-ọbu mma-agha, ma-ọbu agha, ma-ọbu inyinya, ma-ọbu ndi-inyinya, zọputa ha. 8 O we me ka Lo-ruhama rapu ara, o we turu ime, mua nwa-nwoke. 9 Jehova we si, Kpọ aha-ya Lo-ami: n'ihi na unu onwe-unu abughi ndim, Mu onwem agaghi-abu-kwa-ra unu Chineke. 10 Ma ọnu-ọgugu umu Israel gādi ka ájá oké osimiri, nke anāgagh ātùta, nke anāgaghi-agu kwa ọnu; ọ gēru kwa na, n'ebe ahu nke anāsi ha, Ọ bughi ndim ka unu bu, n'ebe ahu ka agāsi ha, Umu Chineke di ndu ka unu bu. 11 Agāchikọta kwa umu Juda na umu Israel, ha gēdo-kwa-ra onwe-ha otù onye-isi, si n'ala-ha rigopu, n'ihi na ihe uku ka ubọchi Jezreel bu.

Hosea 2

1 Sinu umu-nne-unu ndikom, Ami; si-kwa-nu umu-nne-unu ndinyom, Ruhama. 2 Unu na nne-unu kpe ikpe, kpenu; n'ihi na ya onwe-ya abughi nwunyem, Mu onwem abughi kwa di-ya: ya wezuga ikwa-iko-ya nile n'iru ya, ya wezuga kwa ikwa-iko nile nke nwanyi nwere di ọ nākwa n'etiti ara-ya abua; 3 ka M'we ghara iyipu uwe-ya b͕aba ya ọtọ, guzo ya dika n'ubọchi amuru ya, me ya dika ọzara, do ya ka ala ọkpọ-nku, were akpiri-ikpọ-nku me ka ọ nwua; 4 ọ bu kwa n'aru umu-ya ndikom ka M'nāgaghi-enwe obi-ebere; n'ihi na umu-ndikom amuru n'ikwa-iko ka ha bu. 5 N'ihi na nne-ha akwawo iko: nwanyi nke turu ime ha emewo ihe-ihere: n'ihi na ọ siri, Ka m'jeso ndi nāhum n'anya, ndi nēnyem nrim na mirim na aji-anum na flax nkem na manum na ihe-ọṅuṅum. 6 N'ihi nka, le, M'gaje iji ogwu b͕achi uzọ-gi, M'gāb͕achibido kwa ya ogige, o we ghara ichọputa okporo-uzọ-ya nile. 7 Ọ gāb͕aso kwa ndi nāhu ya n'anya, ma ọ gaghi-eru ha aru; ọ gāchọ kwa ha, ma ọ gaghi-achọta ha: o we si, Ka m'je laghachikuru dim mbu; n'ihi na ọ dim nma mb͕e ahu kari ub͕u a. 8 Ma ya onwe-ya amaghi na ọ bu Mu onwem nyere ya ọka-ya na manya-vine ọhu ya, na manu ọhu ya, me ka ọla-ọcha na ọla-edo bara ya uba, bú nke ha ji mere Beal ihe. 9 N'ihi nka ka M'gānaghachi ọkam na mb͕e-ya, na manya-vine ọhum na mb͕e-ya akara àkà, M'gānaputa kwa aji-anum na flax nkem nke enyere ikpuchi ọtọ-ya. 10 Ma ub͕u a ka M'gēkpughe ọtọ-ya n'anya ndi nāhu ya n'anya, ọ dighi kwa onye ọ bula gānaputa ya n'akam. 11 M'gēme kwa ka obi-utọ ya nile kwusi, ya na ememe-ya, na ọnwa ọhu ya, na ubọchi-izu-ike-ya, na mb͕e-ya nile akara àkà. 12 M'gēme kwa ka osisi vine ya na osisi fig ya tọb͕ọrọ n'efu, nke ọ siworo, Onyinye ka ndia burum, nke ndi nāhum n'anya nyeworom: M'gēme kwa ha ka ha ghọ oké ọhia, anu ọhia ewe rie ha. 13 M'gēji kwa ubọchi nile nke Bealim leta ya, bú ndi ọ nēsurere ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, chiri nb͕a-aka-imi-ya na ihe-ichọ-nma-ya ke onwe-ya, jeso ndi nāhu ya n'anya, ma Mu ka o chezọrọ; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 14 N'ihi nka, le, Mu onwem gaje iràra ya, me ka ọ je n'ọzara, M'gāgwa kwa ya okwu nke gābà ya n'obi. 15 M'gēsi kwa n'ebe ahu nye ya ubi-vine-ya nile, na ndagwurugwu Ekoa ibu ọnu-uzọ olile-anya: ọ gāza kwa n'ebe ahu, dika n'ubọchi nile ọ di na nwata, na dika n'ubọchi o siri n'ala Ijipt rigoputa. 16 Ọ gēru kwa n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na i gākpọm Chi; i gaghi-akpọkwam Beal ọzọ. 17 M'gēwezuga kwa aha nile nke Bealim n'ọnu-ya, agaghi-ehota kwa ha n'aha-ha ọzọ. 18 N'ubọchi ahu Mu na anu ọhia na anu-ufe nke elu-igwe na ihe nākpu akpu nke ala gāb͕ara ha ndu: ọ bu kwa uta na mma-agha na agha ka M'gāb͕ajipu n'ala-ha, me ka ha dina ala na ntukwasi-obi. 19 M'gēkwere kwa ilu gi n'Onwem rue mb͕e ebighi-ebi; e, M'gēkwere ilu gi n'Onwem n'ezi omume, na n'ikpé, na n'ebere, na n'obi-ebere nile. 20 M'gēkwere kwa ilu gi n'Onwem n'ikwesi-ntukwasi-obi: i we mara, Jehova. 21 O gēru kwa n'ubọchi ahu na M'gāza, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gāza elu-igwe, ha onwe-ha gāza kwa ala; 22 ala gāza kwa ọka-ya na manya-vine ọhu ya na manu ọhu ya; ha onwe-ha gāza kwa Jezreel. 23 M'gāgha-kwa-ra ya Onwem n'ala-ya dika nkpuru ọghigha; M'gēnwe kwa obi-ebere n'aru Lo-ruhama; M'gāsi kwa Lo-ami, Ndim ka i bu; ndi ahu gāsi kwa, Chinekem.

Hosea 3

1 Jehova we sim, Je kwa, hu nwanyi n'anya nke iko huworo ya n'anya, nke bu kwa nwanyi aluru na nwunye nākwa iko, dika Jehova si ahu umu Israel n'anya, ọ bu ezie na ha onwe-ha nēche iru na chi ọzọ di iche iche, nāhu kwa mbadamba nkpuru-vine amiri ami n'anya. 2 M'we were ego ọla-ọcha iri na ise, na otù homer ọka barley, na nkera homer ọka barley, gotara ya onwem: 3 m'we si ya, Ọtutu ubọchi ka i gānọdurum; i gaghi-akwa iko, i gaghi-abu kwa nwan yi nke nwoke ọ bula: Mu onwem gādi kwa otú a n'ebe i nọ. 4 N'ihi na ọtutu ubọchi ka umu Israel gānọdu nēnweghi eze, nēnweghi kwa onye-isi, nēnweghi kwa àjà, nēnweghi kwa ogidi, nēnweghi kwa ephod na teraphim: 5 emesia umu Israel gālata, chọ Jehova, bú Chineke-ha, na Devid, bú eze-ha; ha gēji kwa oké egwu biakute Jehova, biaru kwa idi-nma-Ya na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia.

Hosea 4

1 Nurunu okwu Jehova, umu Israel: n'ihi na ikpé ka Jehova na ndi bi n'ala nka gēkpe, n'ihi na ọ dighi ezi-okwu, ọ dighi kwa ebere, ọ dighi kwa ọmuma Chineke, di n'ala nka. 2 Ọ bu nání ọb͕ub͕a-iyi, na okwu-ugha, na ob͕ub͕u-madu, na izu-ori, na ikwa-iko; ha etipúwo etipú, iwusi-ọbara-madu emetuwo kwa iwusi-ọbara-madu. 3 N'ihi nka ka ala nka gēru újú, onye ọ bula nke bi nime ya gāta kwa aru, ya na anu ọhia na anu-ufe nke elu-igwe; ọ bu kwa azù nile nke oké osimiri ka agēkpochapu. 4 Ma otú ọ di, ka onye ọ bula ghara ise okwu, ka onye ọ bula ghara kwa iba nba; n'ihi na ndi-gi di ka ndi nēseso onye-nchu-àjà okwu. 5 I gāsu kwa ngọngọ n'ehihie, ọzọ, onye-amuma gēso kwa gi su ngọngọ n'abali; M'gēme kwa ka nne-gi la n'iyì. 6 Emewo ka ndim la n'iyì site n'enweghi ọmuma Chineke: n'ihi na gi onwe-gi ajuwo ọmuma ahu, M'gāju kwa gi, i we ghara iburum onye-nchu-àjà: i chezọwo kwa iwu nke Chineke-gi, M'gēchezọ kwa umu-gi, ọbuná Mu onwem. 7 Dika iba-uba-ha, otú a ka ha mehieworo megidem: nsọpuru-ha ka M'gāb͕anwe ka ọ ghọ ihere. 8 Nmehie ndim ka ha nēri, ọ bu kwa ajọ omume-ha ka ha nēbuli, onye ọ bula nkpuru-obi-ya, nye. 9 Ọ gēru kwa, na ka o si diri ndi ọ bula, otú a ka ọ gādiri onye-nchu-àjà: M'gēji kwa uzọ-ya nile leta ya, ọ bukwa omume-ya nile ka M'gēnyeghachi ya. 10 Ha eriwo kwa ihe, ma afọ agaghi-eju ha; ha akwawo iko, ma ha agaghi-aba uba kari: n'ihi na ha arapuwo inu olu Jehova. 11 Ikwa-iko na manya-vine na manya-vine ọhu nēwepu obi amam-ihe. 12 Ndim nāju ase n'aka osisi-ha, nkpa-n'aka-ha nēgosi kwa ha ihe: n'ihi na mọ nke ikwa-iko nile emewo ka ha kpafue, ha we pua n'okpuru Chineke-ha kwa iko. 13 N'elu ugwu nile ka ha nāchu àjà, n'elu ugwu ntà nile ka ha nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, n'okpuru osisi oak na osisi poplar na osisi terebinth, n'ihi na ǹdò-ya di nma: n'ihi nka ka umu-unu ndinyom nākwa iko, ọ bu kwa n'ihi nka ka ndinyom unu luworo ọhu nākwa iko. 14 M'gaghi-eji nmehie-ha leta umu-unu ndinyom mb͕e ha nākwa iko, M'gāghi-eji kwa nmehie-ha leta ndinyom unu luworo ọhu mb͕e ha nākwa iko; n'ihi na ha onwe-ha nēwezuga onwe-ha so ndinyom nākwa iko, ha nēso kwa ndinyom edoro nsọ ikwa iko chua àjà: ma ndi ọ bula nke nādighi-aghọta ka agākwatu n'ala. 15 Ọ bu ezie na onye nākwa iko ka i bu, Israel, ma ka ikpe ghara ima Juda; unu abia-kwa-la na Gilgal, unu arigo-kwa-la na Bet-even, unu aṅu-kwa-la iyi, si, Jehova nādi ndu. 16 N'ihi na Israel ewezugawo onwe-ya, dika nwa-ab͕ọghọ-ehi nke nēwezuga onwe-ya: ub͕u a ka Jehova gāzù ha dika nwa-aturu n'ebe sara mbara. 17 Onye ekekọtaworo n'arusi di iche iche ka Efraim bu; kwe ka ọ nọduru onwe-ya. 18 Iṅubiga-manya-ókè-ha ewezugawo onwe-ya: ha akwachiwo iko nti; ndi bu ọta-ha ahuwo ihere n'anya nke-uku. 19 Ifufe apiakọtawo ya na nkù-ya; ihere àjà nile ha gēme kwa ha.

Hosea 5

1 Nurunu nka, unu ndi-nchu-àjà, ṅa-kwa-nu nti, unu ulo Israel, unu ulo eze, ge-kwa-nu nti, n'ihi na unu ka ikpé a diri; n'ihi na ib͕udu ka unu buworo na Mizpa, unu abuwo kwa ub͕u ab͕asara n'elu Teboa. 2 Ndi-njehie abamiwo n'ib͕u madu; ma mu onwem bu onye nādọ ha nile aka na nti. 3 Mu onwem mara Efraim, Israel ezonarighkwam: n'ihi na ub͕u a i kwawo iko, Efraim, emeruwo Israel. 4 Omume nile ha agaghi-ekwe ha ichighakute Chineke-ha: n'ihi na mọ nke ikwa-iko nile di nime ha, ọ bu kwa Jehova ka ha nāmaghi. 5 Npako Israel azawo kwa oku n'iru ya: Israel na Efraim gāsu kwa ngọngọ n'ajọ omume-ha; Juda esowo kwa ha su ngọngọ. 6 Ha gāchiri ìgwè ewu na aturu-ha na ìgwè ehi-ha je ichọ Jehova; ma ha agaghi-achọta Ya: O seputawo Onwe-ya n'aru ha. 7 Jehova ka ha ghọb͕uworo; n'ihi na umu nābughi nke Ya ka ha muworo: ub͕u a ka ọnwa ọhu gēripia ha, ha na òkè nile ha. 8 Fùanu opì-ike nime Gibea, Fùanu opì nime Rema: tienu nkpu agha nime Bet-even: n'azu gi, Benjamin. 9 Efraim gāghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu n'ubọchi iba-nba: n'etiti ebo nile nke Israel ka M'meworo ka amara ihe kwesiri ntukwasi-obi. 10 Ndi-isi Juda adiwo ka ndi nēwezuga ókè-ala: n'aru ha ka M'gāwukwasi nrubiga-ókè nke iwem dika miri. 11 Onye anēmeb͕u emeb͕u ka Efraim bu, ọ bu onye anāzọpia n'ikpé; n'ihi na o kwere ijeso ihe enyere n'iwu. 12 Ma Mu onwem, dika nla ka M'nādiri Efraim, dika ire-ure ka M'nādiri ulo Juda. 13 Efraim we hu ọria-ya, Juda hu-kwa-ra ọnyá-ya, Efraim we je Asiria, zigara eze, bú Jereb: ma onye ahu apughi igwọ unu, ọ gaghi-eme kwa ka ọnyá si n'aru-unu la. 14 N'ihi na Mu onwem gādiri Efraim ka ọdum, di-kwa-ra ulo Juda ka nwa-ọdum: Mu onwem, ọbuná Mu Onwem gādọka, la; M'gēbupu, ọ dighi kwa onye-nnaputa di. 15 M'gāla, lata n'ọnọdum, rue mb͕e ikpe gāma ha, ha we chọ irum: n'ahuhu-ha ka ha gāchọsim ike.

Hosea 6

1 Bianu, ka ayi laghachikute Jehova: n'ihi na Ya onwe-ya adọkawo, Ọ gāgwọ kwa ayi; O tib͕uwo, Ọ gēkechi kwa ayi. 2 Ọ gēme ka ayi dighachi ndu mb͕e ubọchi abua gasiri: n'ubọchi nke-atọ ka Ọ gēme ka ayi bilie, ayi ewe di ndu n'iru Ya. 3 Ka ayi mara kwa, ka ayi b͕aso imara Jehova; dika chi-ọbubọ, otú a ka ọpupu-Ya guzosiworo ike: Ọ gābiakute kwa ayi dika oké miri-ozuzo, dika miri-ozuzo ikpe-azu nke nēzosa ala. 4 Gini ka M'gēme gi, Efraim? gini ka M'gēme gi, Juda? n'ihi na ebere-unu di ka igwe-oji ututu, na dika igirigi nke nāla n'isi-ututu. 5 N'ihi nka ka M'jiworo ndi-amuma b͕utue ha; ejiwom okwu nile nke ọnum b͕ue ha: ikpé-gi nile di kwa ka ìhè nke nāputa aputa. 6 N'ihi na ebere atọwom utọ, ọ bughi àjà; ọmuma Chineke atọwokwam utọ kari àjà-nsure-ọku nile. 7 Ma ndi ahu agabigawo pua n'ọb͕ub͕a-ndum, dika Adam: n'ebe ahu ka ha ghọb͕uworom. 8 Gilead bu obodo nke ndi nālu ajọ ihe, nke ewereworo ọbara zọtọsia ya. 9 Ọzọ, dika usu ndi nāpunara madu ihe nēche anwu onye ọ bula, otú a ka òtù ndi-nchu-àjà nēb͕u madu n'uzọ Shekem: e, ajọ ihe-nzube ka ha meworo. 10 N'ulo Israel ka M'huworo ihe jọb͕uru onwe-ya: n'ebe ahu ka ikwa-iko nke Efraim nākwa di, emeruwo Israel. 11 Ọzọ, gi Juda, akaworo gi owuwe-ihe-ubi àkà, mb͕e M'gēme ka ndim adọtara n'agha lata.

Hosea 7

1 Mb͕e M'gāgwọ Israel, mb͕e ahu ka ekpughere ajọ omume Efraim, na ihe ọjọ nile nke Sameria; n'ihi na ha aluwo ọlu ugha: ọzọ, onye-ori nābà n'ulo, usu ndi nāpunara madu ihe amadewo kwa n'èzí. 2 Ma ha adighi-asi n'obi-ha na ọ bu ihe ọjọ nile ha ka M'chetaworo: ub͕u a ka omume nile ha b͕aworo ha buruburu; na ncherita-irum ka ha di. 3 Ha ji ihe ọjọ ha eme ka eze ṅuria, ji kwa okwu-ugha nile ha eme ka ndi-isi ṅuria. 4 Ha nile bu ndi nākwa iko; ha di ka ite-ọku uku nke osi-ite meworo ka ọ di ọku; ọ kwusiri ikpọnwu site na mb͕e edoziri utu ọka flour agwọrọ agwọ rue mb͕e emere ka o ko eko. 5 N'ubọchi eze-ayi ndi-isi jiri idi-ọku nke manya-vine ria ọria; o soro ndi nākwa emò setia aka-ya. 6 N'ihi na ha ebutewo obi-ha nso dika ite-ọku uku, mb͕e ha nēche anwu: ogologo abali nile ka osi-ite-ha nāraru ura; n'ututu ihe ahu nēre dika ọku nēnwu enwu. 7 Ha nile di ọku ka ite-ọku uku, ha ewe ripia ndi-ikpe-ha; ndi-eze nile ha adawo n'ala: ọ dighi onye nākpọkum n'etiti ha. 8 Efraim, n'etiti ndi nile di iche iche ka ya onwe-ya nāgwa onwe-ya ọgwa; Efraim aghọwo ob͕e achicha nke anātugharighi atughari. 9 Ndi ala ọzọ eripiawo ike-ya, ma ya onwe-ya amagh: e, efesawo ya isi-awọ, ma ya onwe-ya amaghi. 10 Npako Israel azawo kwa okwu n'iru ya: ma ha alaghachikuteghi Jehova, bú Chineke-ha, ha achọtaghi kwa Ya, n'ihe a nile. 11 Efraim we di ka nduru nēnweghi uche, ọ dighi obi amam-ihe o nwere: Ijipt ka ha kpọkuworo, Asiria ka ha jekuworo. 12 Mb͕e ha nēje M'gāb͕asa ub͕um n'aru ha; dika anu-ufe nke elu-igwe ka M'gēme ka ha rida: M'gādọ ha aka na nti, dika ihe nzukọ-ha nuworo. 13 Ahuhu diri ha! n'ihi na ha awafunariwom; nbibi diri ha! n'ihi na ha ejehiewo megidem: ọ bu ezie na Mu onwem nāb͕aputa ha, ma ha onwe-ha ekwuwo okwu-ugha di iche iche megidem. 14 Ha ejighi kwa obi-ha tikuem, kama ha nākwasi ákwá ike n'elu ihe-ndina-ha: n'ihi ọka na manya-vine ọhu ka ha nāchikọta onwe-ha, ha nēwezuga onwe-ha imegidem. 15 Ọ bu ezie na Mu onwem adọwo ha aka na nti, me ka ogwe-aka-ha di ike, ma Mu ka ha nēchè ihe ọjọ megide. 16 Ha nālaghachi, ma ọ bughi Onye nọ n'elu ka ha nālaghachikute; ha di ka uta nāghọ aghughọ: ndi-isi-ha gāda site na mma-agha, site n'oké iwe nke ire-ha: nka bu ikwa-emò-ha n'ala Ijipt.

Hosea 8

1 Tiye opì-ike n'okpo-ọnu-gi. Dika ugo ka ọ nābia megide ulo Jehova; n'ihi na ha agabigawo pua n'ọb͕ub͕a-ndum, ọ bu kwa iwum ka ha jehieworo megide. 2 Mu ka ha gētiku, si, Chinekem, ayi, bú Israel, mara Gi. 3 Israel ajusiwo ezi ihe: onye-iro gāchu ya. 4 Ha onwe-ha edowo ndi-eze, ma ọ bughi site n'akam; ha edowo ndi-isi, ma amaghm: ọla-ọcha-ha na ọla-edo-ha ka ha jiworo mere onwe-ha arusi di iche iche, ka ewe bipu ha. 5 Ọ jusiwo nwa-ehi-gi, Sameria; iwem adiwo ọku megide ha: rùe ole mb͕e ka ha nāgaghi-enwe ike ighọ ndi nēmeghi ihe ọjọ? 6 N'ihi na Israel ka ọbuná ihe a si puta; onye-ọ̀kà mere ya, ọ bughi kwa Chineke ka ọ bu: n'ihi na umu-irighiri-ihe ka nwa-ehi Sameria gāghọ. 7 N'ihi na ifufe ka ha nāgha dika nkpuru-ọghigha, ọ bu kwa oké ifufe ka ha gēwe dika ihe-ubi: ọ dighi ọka guzoro eguzo o nwere; ihe-opupú agaghi-eme utu ọka; ọ buru na o me ma eleghi anya, ndi ala ọzọ gēloda ya. 8 Elodawo Israel: ub͕u a ha aghọwo ihe dika ihe nādighi-atọ utọ n'etiti mba nile. 9 N'ihi na ha onwe-ha arigowo n'Asiria, dika inyinya-ibu-ọhia nke nání ya nọ iche: Efraim egowo ndi nāhu ya nānya. 10 E, mb͕e ha gēgo ha n'etiti mba nile, ub͕u a ka M'gāchikọta ha; ọ gēwuta kwa ha nwa mb͕e ntà site n'ibu eze ndi-isi gēbo ha. 11 N'ihi na Efraim emewo ka ebe-ichu-àjà ba uba imehie, ya bu na ebe-ichu-àjà nile aghọworo ya nmehie. 12 Anamedere ya orú nnù ihe na nnù ise nke iwum, ma dika ihe ala ọzọ ka aguworo ha. 13 Àjà nile nke onyinyem nile, ha nāchu anu nàjà, we rie ya; ihe-ha adighi-atọ Jehova utọ: ub͕u a ka Ọ gēcheta ajọ omume-ha, leta nmehie nile ha; ha onwe-ha gālaghachi n'Ijipt. 14 Israel echezọwo kwa Onye ahu Nke meworo ya, o we wue ulo uku di iche iche; Juda emewo kwa ka obodo ewusiri ike ba uba: ma M'gēzite ọku n'obodo-ya nile, o gēripia kwa ulo-elu-ya nile.

Hosea 9

1 Aṅurila, Israel, rue otite-egwú-ọṅù, dika ndi nile di iche iche; n'ihi na i puwo n'aka Chineke-gi kwaba iko, i huwo onyinye n'anya n'ebe-nzọcha-ọka nile. 2 Ebe-nzọcha-ọka na ebe-nzọcha-nkpuru-vine agaghi-azù ha, manya-vine ọhu gēbilata-kwa-ra ya. 3 Ha agaghi-ebi n'ala Jehova; ma Efraim gālaghachi n'Ijipt, ọ bu kwa n'Asiria ka ha gēri ihe ruru árú. 4 Ha agaghi-awusiri Jehova àjà manya-vine, àjà di iche iche ha agaghi-atọ kwa Ya utọ: dika nri ndi nēru újú ka nri-ha gādiri ha; ndi nile ndi nēri ya gāghọ ndi ruru árú: n'ihi na nri-ha gādiri ọchichọ nkpuru-obi-ha; ọ gaghi-abata n'ulo Jehova. 5 Gini ka unu gēme n'ubọchi nke mb͕e ákàrà, na n'ubọchi ememe Jehova? 6 N'ihi na, le, ha esiwo na nbibi la, ma Ijipt gāchikọta ha, Memfis gēlì ha: ihe ọla-ọcha ha anāchọsi ike, akuba gēnweta ha: ogwu gādi n'ulo-ikwū nile ha. 7 Ubọchi nile nke nleta abiawo, ubọchi nkwughachi abiawo; Israel gāma ya: onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ka onye-amuma bu, onye-ara ka onye nwere Mọ Chineke bu, n'ihi iba-uba nke ajọ omume-gi, na n'ihi na ihe bara uba ka ikpọ-asì ahu bu. 8 Onye-nche ka Efraim bu n'aka Chinekem: ma onye-amuma, ib͕udu nke osi-ọnyà di n'uzọ-ya nile, ikpọ-asì di kwa n'ulo Chineke-ya. 9 Ha abamiwo n'ibibi onwe-ha, dika n'ubọchi nke Gibea: Ọ gēcheta ajọ omume-ha, leta nmehie nile ha. 10 Dika nkpuru-vine n'ọzara ka M'chọtara Israel; dika nkpuru nke buru uzọ cha n'osisi fig n'oge mbu ya ka M'huru nna-unu-hà: ma ha onwe-ha biakutere Beal-peoa, kewaputa onwe-ha nye ihere ahu, ghọ ihe-árú dika ihe ahu ha huru n'anya. 11 Efraim, dika anu-ufe ka nsọpuru-ha gēfepu: ọmumu-nwa na idi-ime na itu-ime ewe ghara idi. 12 E, ọ buru na ha azulite umu-ha, ma M'gāb͕aba ha aka nwa, madu ọ bula ewe ghara idi: e, ahuhu di-kwa-ra ha mb͕e M'gēsi n'aru ha wezuga Onwem! 13 Efraim, dika M'leworo Taia anya, bú ihe akuworo n'ebe mara nma: ma Efraim aghaghi ichiputara ob͕u-madu umu-ya. 14 Nye ha, Jehova: gini ka I gēnye? nye ha afọ nēmebi ime na ara kpọrọ nku. 15 Ihe ọjọ nile ha di nime Gilgal: n'ihi na n'ebe ahu ka M'kpọrọ ha asì: n'ihi ihe ọjọ nke omume nile ha ka M'gāchupu ha n'ulom: M'gaghi-ahu kwa ha n'anya ọzọ; ndi-isi-ha nile bu ndi nēwezuga onwe-ha. 16 Etib͕uwo Efraim, nkpọrọgwu-ha akpọnwuwo, ha agaghi-ami nkpuru: e, asi na ha amua nwa, ma M'gēme ka umu afọ-ha anāchọsi ike nwua. 17 Chinekem gāju ha, n'ihi na ha egeghi Ya nti: ha gābu kwa ndi nāwaghari n'etiti mba nile.

Hosea 10

1 Osisi vine nke nēkosa ekosa ka Israel bu, nkpuru ka ọ nāmiziri onwe-ya: ọ bu dika iba-uba nke nkpuru-ya si di ka o mere ka ebe-ichu-àjà-ya ba uba; ọ bu dika ọdi-nma nke diri ala-ya si di ka ha mere ka ogidi nile di nma. 2 O kesawo obi-ha; ub͕u a ka ikpe gāma ha: Ya onwe-ya gētipia ebe-ichu-àjà nile ha, bibie ogidi nile ha. 3 N'ezie ub͕u a ka ha gāsi, Ọ dighi eze ayi nwere: n'ihi na ayi atughi egwu Jehova; ma eze, gini ka ọ gēmere ayi? 4 Ha ekwuwo okwu efu di iche iche, ha nāb͕a iyi ugha, ha nāb͕a ndu: ikpe ewe pulite dika hemlok nime ọ̀b͕à ubi. 5 Ọ bu bayere umu-ehi nke Bet-even ka ndi bi na Sameria gātu ujọ: n'ihi na ndi-ya gēruru ya újú, ha na ndi-nchu-àjà-ya ndi nētere ya-ri egwú ọṅù, n'ihi nsọpuru-ya, n'ihi na o siwo n'ebe ọ nọ je biri n'ala ọzọ. 6 Ọ bu kwa ihe ahu ka agēduga n'Asiria, ibu onyinye-inata-iru-ọma agēnye eze, bú Jereb: ihere ka Efraim gānata, ihere ndum-ọdu-ya gēme kwa Israel. 7 Emewo ka Sameria la n'iyì, ya na eze-ya, dika irighiri-osisi n'elu miri. 8 Agēkpochapu kwa ebe nile di elu nke Even, bú nmehie Israel: ogwu na uke gēpulite n'ebe-ichu-àjà nile ha; ha gāsi kwa ugwu nile, Kpuchienu ayi; ha gāsi kwa ugwu ntà nile, Dakwasinu ayi. 9 Site n'ubọchi Gibea ka i mehieworo, gi Israel: n'ebe ahu ka ha guzoro; ka agha anēbuso umu ajọ omume we ghara irute ha nime Gibea. 10 Mb͕e M'chọrọ, M'gādọ ha aka na nti; agāchikọta kwa ndi nile di iche iche imegide ha, mb͕e agēke ha ab͕u n'ajọ omume-ha abua. 11 Efraim bu kwa nwa-ab͕ọghọ-ehi nke emeworo ka ọ muta ihe, nke nāhu izọcha ọka n'anya; ma Mu onwem agabigawo n'elu olu-ya di nma: M'gēme ka anọkwasi Efraim dika inyinya; Juda gādọ ihe eji gwu ala-ubi, Jekob gētipiara ya ájá. 12 Gharanu onwe-unu nkpuru n'ezi omume, wenu ihe-ubi dika ebere si di; lucharanu onwe-unu ubi: n'ihi na ọ bu mb͕e ichọ Jehova, rue mb͕e Ọ gābia, zokwasi unu ezi omume dika miri. 13 Unu aluwo nmebi-iwu dika ubi, ajọ omume ka unu weworo dika ihe-ubi; unu eriwo nkpuru okwu-ugha: n'ihi na i tukwasiri uzọ-gi obi, n'iba-uba nke ndi-dike-gi. 14 Nkpọtu gēbili kwa n'etiti umu-nna-gi, ọ bu kwa ebe-gi nile ewusiri ike ka agēbibi, dika Shalman bibiri Bet-abel n'ubọchi agha: nne n'elu umu-ya ka atupiara. 15 Otú a ka Bet-el gēme unu n'ihi ihe ọjọ unu nke kachasi ihe ọjọ nile: na chi-ọbubọ ka agēme ka eze Israel lasia n'iyì.

Hosea 11

1 Mb͕e Israel bu nwata, ahurum ya n'anya, ọ bu kwa site n'Ijipt ka M'kpọputara nwam. 2 Dika ha kpọrọ ha òkù, otú a ka ha puru n'iru ha nēje: Bealim ka ha churu àjà, surere arusi di iche iche apiri api ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ. 3 Ma Mu onwem nēzí Efraim ije ije; O kuru ha n'ogwe-aka-Ya abua; ma ha amataghi na emerem ka aru di ha nma. 4 Achirim udọ̀ madu, bú ihe-nhiegide ihu-n'anya, adọ ha; M'we diri ha dika ndi nēbuli yoke n'elu ab͕a-ha, anameseti kwa akam me ka ha rie ihe. 5 Ọ gaghi-alaghachi n'ala Ijipt; ma onye Asiria ahu gābu eze-ya n'ihi na ha juru ilaghachi. 6 Mma-agha gēfeghari kwa n'obodo-ya nile, me ka ihe-ntuchi-ya nile gwusia, ripia ha, site na ndum-ọdu nile ha. 7 N'ihi na ndim nākwughari efekefe n'obi idaghachi azu site n'ebe M'nọ: ọ bu ezie na Onye nke nọ n'elu ka ha nākpọ ha ibiakute, ma ọ dighi otù onye efu gēbuli onwe-ya elu. 8 M'gēsi aṅa rara gi nye, Efraim? M'gēsi aṅa nyebiga gi, Israel? M'gēsi aṅa me gi ka i di ka Adma? M'gēsi aṅa do gi ka Zeboim? obim ab͕aghariwo n'arum, obi-eberem nile di ọku n'otù. 9 M'gaghi-emezu idi-ọku nke iwem, M'gaghi-alaghachi ibibi Efraim: n'ihi na Chineke ka M'bu, abughm madu; n'etiti gi ka Mu, bú Onye nsọ, nọ: M'gaghi-abata kwa n'obodo. 10 Jehova ka ha gējeso, dika ọdum ka Ọ gāb͕ọ uja; N'ihi na Ya onwe-ya gāb͕ọ uja, umu gesi kwa n'Ọdida-anyanwu bia nāma jijiji. 11 Ha gēsi n'Ijipt bia nāma jijiji dika nnunu, si kwa n'ala Asiria dika nduru: M'gēme kwa ka ha biri n'ulo nile ha: ọ bu ihe si n'ọnu Jehovaa puta. 12 Efraim ji okwu-ugha ab͕am buruburu, ọ bu kwa aghughọ ka ulo Israel ji: Juda nọ kwa nālupu alupu n'aka Chineke, bú n'aka Onye kachasi nsọ Nke kwesiri ntukwasi-obi.

Hosea 12

1 Efraim ji ifufe azù onwe-ya, ọ nāb͕aso kwa ifufe Iru-anyanwu: ogologo ubọchi nile ọ nēme ka okwu-ugha na nbibi ba uba; ha na Asiria nāb͕a kwa ndu, anēbuga kwa manu n'Ijipt. 2 Jehova nwe-kwa-ra ikpe Ya na Juda gēkpe, Ọ gēji kwa nmehie Jekob leta ya dika uzọ-ya nile si di; dika omume-ya nile si di ka Ọ gēnyeghachi ya. 3 Mb͕e ọ nọ n'afọ o jidere nwa-nne-ya n'ikiri-ukwu; ọ bu kwa n'ume-ya ka o jisiri ike n'ebe Chineke nọ: 4 o we jisie ike n'aru Mọ-ozi, we nwe ike kari: ọ kwara ákwá, riọ Ya aririọ: nime Bet-el ka Ọ chọtara ya, ọ bu kwa n'ebe ahu ka Ọ kpayere ayi uka; 5 ọbuná Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha; Jehova bu aha-ncheta-Ya. 6 Ma gi onwe-gi, nime Chineke-gi ka i gālata: debe ebere na ikpé ziri ezi, le kwa anya Chineke-gi mb͕e dum. 7 Kenean! n'aka-ya ka ihe-ọtùtù aghughọ di: ọ huru imeb͕u emeb͕u n'anya. 8 Efraim we si, N'ezie aghọwom ọgaranya, achọtaworom onwem àkù: ihe nile m'nādọb͕u onwem n'ọlu inweta agaghi-achọtaram ajọ omume nke bu nmehie. 9 Ma Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi, site n'ala Ijipt; M'gēme kwa ka i biri n'ulo-ikwū ọzọ, dika n'ubọchi nile nke mb͕e akara àkà. 10 Agwawokwam ndi-amumam okwu, ọ bu kwa Mu onwem mere ka ọhù ba uba; ọ bu kwa site n'aka ndi-amuma ka M'ji ihe ama àtù. 11 Ọ buru na Gilead bu ajọ ihe, nání ihe-efu ka ha ghọworo; nime Gilgal ha nāchu àjà oke-ehi di iche iche: e, ebe-ichu-àjà nile ha di ka obo-ihe n'ọ̀b͕à ubi. 12 Jekob we b͕alaga n'ọhia Efraim, Israel we fè òfùfè n'ihi nwunye, ọ bu kwa n'ihi nwunye ka o debere aturu. 13 Ọ bu kwa onye-amuma ka Jehova jiri me ka Israel si n'Ijipt rigoputa, ọ bu kwa onye-amuma ka ejiri debe ya. 14 Efraim akpasuwo iwe oké ilu: ọ bu kwa iwusi-ọbara-madu-ya ka Ọ gārapu n'aru ya, ọ bu kwa ita-uta-ya ka Onye-nwe-ya gēnyeghachi ya.

Hosea 13

1 Mb͕e Efraim jiri ima-jijiji kwu okwu, ya onwe-ya buliri onwe-ya elu n'Israel: ma ikpe mara ya nime Beal, o we nwua. 2 Ma ub͕u a ha nēmehie kari, we mere onwe-ha arusi apiri api site n'ọla-ọcha-ha, bú arusi di iche iche dika nghọta-ha si di, ọlu nke ndi-ọ̀kà ka ha nile bu: ọ bu bayere ihe ndia ka ha onwe-ha nēkwu okwu, si, Ka ndi nāchu àjà madu sutue umu-ehi ọnu. 3 N'ihi nka ka ha gādi ka igwe-oji ututu, na dika igirigi nke nāla n'isi-ututu, dika ib͕ob͕o-ọka nke oké ifufe nēfechapu n'ebe-nzọcha-ọka, na dika anwuru-ọku si apu na window. 4 Ma Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi, site n'ala Ijipt; ọ dighi kwa chi, ma-ọbughi náním, i gāmara, onye-nzọputa adighi kwa, ma-ọbughi náním. 5 Mu onwem mara gi n'ọzara, n'ala kpọrọ oké nku. 6 Dika ọtita-nri-ha si di, otú a ka afọ juru ha; afọ juru ha, obi-ha we di elu; n'ihi nka ka ha chezọworom. 7 M'we diri ha ka ọdum: dika agu, ọ bu n'uzọ ka M'gēche anwu: 8 M'gādakwasi ha dika anu-ọhia bear nke b͕ara aka nwa, M'gādọwa anu-aru b͕ochiri obi-ha: M'gēri ha n'ebe ahu dika ọdum; anu ọhia gādọka ha. 9 Ọ bu nbibi-gi, Israel, na i nēmegidem, nēmegide iye-aka-gi. 10 Òle ebe eze-gi nọ ub͕u a, ka o we zọputa gi n'obodo-gi nile? òle ebe ndi-ikpe-gi nọ, ndi i kwuru okwu bayere ha, si, Nyem eze na ndi-isi? 11 Enyem i eze n'iwem, anapukwam ya nime nrubiga-ókè nke iwem. 12 Ihe ekechiri ekechi ka ajọ omume Efraim bu; ihe ezobere ezobe ka nmehie-ya bu. 13 Ihe-nb͕u nile nke nwanyi ime nēme gābiakute ya: ya onwe-ya bu nwa nāmaghi ihe; mb͕e oge eruwo ọ dighi-eguzo n'ebe ib͕ọwaputa umu. 14 N'aka ala-mọ ka M'gēsi b͕aputa ha; n'aka ọnwu ka M'gēme ka ha si pua nwere onwe-ha: òle ebe ajọ ọria-gi nile nke nēfe efe di, gi ọnwu? òle ebe nbipu-gi di, gi ala-mọ? agēzonari anyam abua nchèghari. 15 Ọ bu ezie na ya onwe-ya nāmi nkpuru n'etiti umu-nne-ya, ma ifufe Iru-anyanwu gābia, bú ifufe Jehova nke nēsi n'ọzara fegota, ọmi-ya ewe ta, isi-iyi-ya gāmikọ kwa: nke ahu gāpunara ya àkù nke ihe ọ bula anāchọsi ike. 16 Sameria gāhu ahuhu ikpe-ọmuma-ya; n'ihi na ọ nupuwo isi n'okpuru Chineke-ya: site na mma-agha ka ha gāda; agātupia umu-ntakiri-ha, agāb͕awa kwa ndinyom-ha di ime afọ.

Hosea 14

1 Israel, laghachikute Jehova, bú Chineke-gi; n'ihi na i suwo ngọngọ site n'ajọ omume-gi. 2 Chirinu okwu n'aka-unu laghachikute Jehova: sinu Ya, Bupu ajọ omume nile ayi, nara ezi ihe: ayi ewe kwughachi eb͕ub͕ere-ọnu-ayi, dika oke-ehi. 3 Asiria agaghi-azọputa ayi; ọ bughi n'elu inyinya ka ayi gānọkwasi: ayi agaghi-asi kwa ọlu aka-ayi ọzọ, Chi-ayi ka unu bu: n'ihi na ọ bu nime Gi ka nwa-nb͕ei nāchọta obi-ebere. 4 M'gāgwọ ndaghachi-azu-ha, M'gāhu ha n'anya n'afọ-ofufo: n'ihi na iwem esiwo n'aru ya chigharia. 5 M'gādiri Israel dika igirigi, ọ gāma ifuru dika urodi, b͕asa nkpọrọgwu-ya nile dika Lebanon. 6 Ome-ya nile gāwasa, ima-nma-ya gādi kwa ka osisi olive, ísì ọma o nēsì gādi ka Lebanon. 7 Ndi bi n'okpuru ǹdò-ya gālata, me ka ọka di ndu, ha gāma ifuru dika osisi vine: ihe-ncheta-ya gādi ka manya-vine nke Lebanon. 8 Efraim gāsi, Gini ka mu na arusi di iche iche nwekọrọ ọzọ? Mu onwem azawo, M'gēlegide kwa ya anya: mu onwem di ka osisi di ndu; esi nam chọta nkpuru-gi. 9 Ònye bu onye-amam-ihe? ọ gāghọta kwa ihe ndia; ònye bu onye-nghọta? ọ gāma kwa ha. N'ihi na uzọ nile nke Jehova ziri ezi, ndi ezi omume gēje kwa ije nime ha; ma ndi-njehie gāsu ngọngọ nime ha.

Joel 1

1 Okwu Jehova nke ruru Joel, nwa Petuel, nti. 2 Nurunu nka, unu ndi-okenye, ṅa-kwa-nu nti, unu ndi nile bi n'ala nka. Nka, ọ̀ diwo n'ubọchi-unu? mà-ọbu n'ubọchi nna-unu-hà? 3 Kọrọnu ya umu-unu, ka umu-unu kọ-kwa-ra umu-ha, ka umu-ha kọ-kwa-ra ọb͕ọ ọzọ. 4 Ihe palmer-worm rifọworo ka igurube riworo; ihe igurube rifọworo ka ukpala riworo; ihe ukpala rifọworo ka ọbubu riworo. 5 Tetanu, unu ndi nāṅubiga manya ókè, kwanu ákwá; kwasi-kwa-nu ákwá ike, unu nile ndi nāṅu manya-vine, n'ihi manya utọ; n'ihi na ebipuwo ya n'ọnu-unu. 6 N'ihi na otù mba arigokwasiwo n'alam, o nwere ume, nādighi kwa ọnu-ọgugu; ezé-ya nile di ka ezé ọdum, o nwe-kwa-ra ikiri-ezé nke nne-ọdum. 7 O mewo ka osisi vine nkem ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, o mewo ka osisi fig nkem ghọ irighiri-osisi: o kpechapusiwo nb͕ub͕ọ-ya, kpofue ya; emewo ka alaka-ya nile di ọcha. 8 Kwa ákwá dika nwa-ab͕ọghọ nke ekeworo ákwà-nkpe n'ihi di o nwere na nwata. 9 Ebipuwo onyinye-inata-iru-ọma na àjà-ihe-ọṅuṅu n'ulo Jehova; ndi-nchu-àjà, bú ndi nējere Jehova ozi, eruwo újú. 10 Emebiwo ubi, ala eruwo újú; n'ihi na emebiwo ọka, ihere emewo manya-vine ọhu, manu ọhu atalatawo. 11 Ka ihere me unu, ndi-ubi, kwasienu ákwá ike, unu ndi-ubi-vine, bayere ọka wheat, baye-kwa-ra ọka barley; n'ihi na owuwe-ihe-ubi alawo n'iyì. 12 Ihere emewo osisi vine, osisi fig atalatawo; osisi pomegranate, nkwu kwa, na osisi apple, osisi nile nke ọhia akpọnwuwo akpọnwu: n'ihi na ihere emewo obi-utọ, ọ pua n'aru umu madu. 13 Kenu ákwà-nkpe n'úkwù-unu, ti-kwa-nu aka n'obi, unu ndi-nchu-àjà; kwasienu ákwá ike, unu ndi-oje-ozi nke ebe-ichu-àjà; bianu, nọ ọnọdu-abali n'ákwà-nkpe, unu ndi nējere Chinekem ozi: n'ihi na eb͕ochiwo onyinye-inata-iru-ọma na àjà-ihe-ọṅuṅu n'ulo Chineke-unu. 14 Donu obubu-ọnu nsọ, Kpọnu ubọchi nb͕ochi, chikọtanu ndi-okenye na ndi nile bi n'ala n'ulo Jehova, bú Chineke-unu, tiku-kwa-nu Jehova. 15 Ewó, ubọchi ahu! n'ihi na ubọchi Jehova di nso, dika nbibi nke sitere n'aka Onye puru ime ihe nile ka ọ gābia. 16 Ọ̀ bughi na ncherita-iru anya-ayi ka ebipuworo ihe-oriri, e, ọṅù na otite-egwú-ọṅù n'ulo Chineke-ayi? 17 Nkpuru-ọghigha akpọnwuwo n'okpuru ọkpurukpu-ájá-ha; emewo ka ulo nile anēdebe ihe-oriri tọb͕ọrọ n'efu, akwatuwo ọba nile; n'ihi na ihere emewo ọka. 18 Le otú anu-ulo ezewo ume nke-uku! ọ nāb͕a ìgwè ehi nile ghari, n'ihi na ọ dighi nri-ọtita ha nwere; e, ìgwè ewu na aturu nile ahuwo ahuhu ikpe-ọmuma. 19 Ọ bu Gi, Jehova, ka m'nākpọku: n'ihi na ọku erichapuwo ebe-ita-nri nile nke ọzara, ire-ọku esuyewo kwa ọku n'osisi nile nke ọhia. 20 Ọzọ, agu Gi nāgu anu ọhia nile: n'ihi na ebe nile miri si erù atasiwo, ọku eripiawo kwa ebe-ita-nri nile nke ọzara.

Joel 2

1 Fùanu opì-ike nime Zaion, ti-kwa-nu nkpu agha n'ugwu nsọm; ka ndi nile ndi bi n'ala nka ma jijiji: n'ihi na ubọchi Jehova nābia, n'ihi na ọ di nso; 2 ọ bu ubọchi ọchichiri na oké nb͕achi, ubọchi igwe-oji na oké ọchichiri, dika chi-ọbubọ nke bọsaworo n'elu ugwu nile; otù ndi nābia di ọtutu nwe kwa ume, ihe di ka ha adighi site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, mb͕e ha gasiri ihe di ka ha agaghi-adi ọzọ, rue arọ nile nke ọb͕ọ na ọb͕ọ. 3 N'iru ha ka ọku nēripia ihe; ọ bu kwa n'azu ha ka ire-ọku nēsuye ọku esuye: dika ubi ahu ab͕ara ogige, bú Iden, ka ala di n'iru ha, n'azu ha ọ bu ọzara tọb͕ọrọ n'efu; e, ọ dighi kwa ihe ọ bula b͕apuworo n'aka-ha. 4 Dika inyinya si di n'ile ha anya, otú a ka ha di n'ile ha anya; e, dika ndi-inyinya, otú a ka ha nāb͕a ọsọ. 5 Dika olu ọtutu ub͕ọ-ala n'elu ugwu ka ha nāmali amali, dika olu ire-ọku nke nēripia ahihia-ọka, dika otù ndi nke nwere ume nke edoworo n'usoro agha. 6 N'iru ha ndi nile di iche iche nāb͕ali: iru nile achagharisiwo. 7 Dika ndi-dike ka ha nāb͕a ọsọ; dika ndi-agha ka ha nārigo mb͕idi; onye ọ bula n'uzọ-ya nile, otú a ka ha nāga ije, ha adighi-agwab͕u kwa agwab͕u n'ojije nile ha. 8 Ha adighi-enurita onwe-ha; onye ọ bula n'uzọ-ya atuliri atuli, otú a ka ha nāga ije: ọ bu kwa n'etiti ihe-agha ka ha nāda nējebìghi ije-ha. 9 N'obodo ka ha nāb͕aghari; n'elu mb͕idi ka ha nāb͕a ọsọ; n'ulo ka ha nārigobata; ha si na window nile abà nime dika onye-ori. 10 N'iru ha ka ala maworo jijiji; elu-igwe emewo nkpatu: anyanwu na ọnwa ejiwo nji, kpakpando achikọpuwo kwa onwunwu-ha: 11 Jehova emewo kwa ka olu-Ya da n'iru usu-ndi-agha-Ya; n'ihi na ihe bara uba nke-uku ka ọmuma-ulo-ikwū-Ya bu; n'ihi na onye nwere ume ka onye nēme ihe O kwuru bu: n'ihi na ubọchi Jehova di uku di kwa egwu nke-uku; ònye kwa gānagide ya? 12 Ma ọbuná ub͕u a, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), werenu obi-unu nile, werekwa obubu-ọnu, were kwa ikwa-ákwá, were kwa iti-aka-n'obi, chigharikutem: 13 dọwa-kwa-nu obi-unu, adọwa-kwa-la uwe-unu, chigharikute Jehova, bú Chineke-unu: n'ihi na Onye-amara na Onye-obi ebere ka Ọ bu, Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ, Nke nāba kwa uba n'ebere, Ọ nēcheghari kwa uche bayere ihe ọjọ ahu Ọ gēweta. 14 Ònye mara? eleghi anya O gēchighari, chègharia uche, me ka ngọzi fọdu n'azu Ya; bú onyinye-inata-iru-ọma na àjà-ihe-ọṅuṅu inye Jehova, bú Chineke-unu. 15 Fùanu opì-ike nime Zaion, donu obubu-ọnu nsọ, kpọsanu ubọchi nb͕ochi: 16 menu ka ndi Israel zukọta, donu nkpọkọta Israel nsọ, chikọtanu ndi-okenye, menu ka umu-ntakiri na ndi nāṅu ara zukọta: ka onye nālu nwunye ọhu si n'ime-ulo-ya puta, ka nwunye ọhu si kwa n'ulo-ndina-ya puta. 17 Ka ndi-nchu-àjà, bú ndi nējere Jehova ozi, kwa ákwá n'etiti uzọ-nbata-Ya na ebe-ichu-àjà-Ya, si, Jehova, mere ndi-Gi ebere, arara-kwa-la ihe-nketa-Gi nye n'ita-uta, Ka mba nile ọzọ we ghara ichi ha: n'ìhi gini ka ha gāsi n'etiti ndi nile dí iche iche, Òle ebe Chineke-ha nọ? 18 Jehova we kwo ekworo ala-Ya, nwe ọmiko n'aru ndi-Ya. 19 Jehova we za, si ndi-Ya, Le, M'ganēzitere unu ọka-unu na manya-vine ọhu unu na manu ọhu unu, afọ ya ewe ju unu: M'gaghi-eme kwa unu ihe-ita-uta ọzọ n'etiti mba nile: 20 ma M'gēme ka usu-ndi-agha Ugwu ahu si n'aru-unu je n'ebe di anya, M'gāchubà kwa ya n'ala kpọrọ nku na ebe tọb͕ọrọ n'efu, iru-ya n'oké osimiri Iru-anyanwu, na nsọtu-Ya n'oké osimiri Ọdida-anyanwu; ísì ọjọ ya gārigo kwa, e, ísì-ya nke jọb͕uru onwe-ya gārigo, n'ihi na o mewo onwe-Ya uku n'ime ihe. 21 Atula egwu, gi ala, te egwú ọṅù, ṅuri kwa; n'ihi na Jehova emewo Onwe-ya uku n'ime ihe. 22 Unu atula egwu, unu anu ọhia; n'ihi na ebe-ita-nri nile nke ọzara nēpuputa ahihia ndu, n'ihi na osisi nāmi nkpuru-ya, osisi fig na osisi vine nāmi nkpuru ka ike-ha ra. 23 Umu Zaion, teghari-kwa-nu egwú ọṅù, ṅuri kwa na Jehova, bú Chineke-unu: n'ihi na Ọ nēnye unu miri-ozuzo mbu ka ezi omume-Ya si di, me kwa ka oké miri-ozuzo zodatara unu, bú miri-ozuzo mbu na miri-ozuzo ikpe-azu, n'ọnwa mbu. 24 Ebe-nzọcha-ọka nile gējuputa kwa n'ọka wheat, ebe-inara-manya-vine na manu gērubiga kwa na manya-vine ọhu na manu ọhu. 25 M'gākwughachi kwa unu arọ nile nke igurube na ukpala na ọbubu na palmer-worm riworo, bú oké usu-ndi-agham nke M'zitere n'etiti unu. 26 Unu gēriju afọ, afọ ewe ju unu, unu ewe to aha Jehova, bú Chineke-unu, Onye mesoworo unu n'ilu oké ọlu: ihere agaghi-eme kwa ndim rue mb͕e ebighi-ebi. 27 Unu gāma kwa na n'etiti Israel ka M'nọ, na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, na ọ dighi onye ọzọ: ihere agaghi-eme kwa ndim rue mb͕e abighi-ebi. 28 O gēru kwa ma emesia, na M'gāwusa Mọm n'aru anu-aru nile, bú madu; umu-unu ndikom na umu-unu ndinyom gēbu kwa amuma, ndi-okenye-unu gārọ nrọ, umu-okorọbia-unu gāhu ọhù: 29 e, ọbuná n'aru ndi-orù ndikom na n'aru ndinyom nēje ozi ka M'gāwusa Mọm na mb͕e ahu. 30 M'gēnye kwa ihe-ebube di iche iche n'elu-igwe na n'uwa: ọbara, na ọku, na ogidi nke anwuru-ọku. 31 Anyanwu gāb͕anwe ghọ ọchichiri, ọnwa gāb͕anwe kwa ghọ ọbara, tutu ubọchi Jehova abia, bú ubọchi ahu di uku di kwa egwu. 32 Ọ gēru kwa, na onye ọ bula nke gākpọku aha Jehova, agēme ka o wepuga onwe-ya: n'ihi na n'ugwu Zaion na nime Jerusalem ka ufọdu ndi b͕apuru ab͕apu gādi, dika Jehova siworo, na n'etiti ndi fọduru afọdu ka ndi Jehova nākpọ gādi.

Joel 3

1 N'ihi na, le, na mb͕e ahu na n'oge ahu, mb͕e M'gēme ka ndi Juda na Jerusalem adọtara n'agha lata, 2 M'gāchikọta mba nile, me ka ha rida na ndagwurugwu Jehoshafat; Mu na ha gēkpe kwa ikpe n'ebe ahu bayere ndim na ihe-nketam, bú Israel, ndi ha chusaworo n'etiti mba nile, ọ bu kwa alam ka ha kère. 3 Ọ bu kwa ndim ka ha fetaworo na nzà: ha we nye nwa-okoro iji b͕anwe nwanyi nākwa iko, nwa-mb͕ọ ka ha re-kwa-ra n'ihi manya-vine, ka ha we ṅua. 4 Ọzọ kwa, gini ka unu gēmem, unu Taia na Zaidon na buruburu-ala nile nke Filistia? Ọ̀ di nmeso M'mesoworo unu unu onwe-unu nākwughachim, ma ọ̀ bu na ihe di unu onwe-unu nēmesom? M'gēji ngwa na ọsọ nyeghachi nmeso-unu n'isi-unu. 5 Ebe ọ bu ọla-ọcham na ọla-edom ka unu wereworo, ebe ọ bu kwa ezi ihem nile anāchọsi ike ka unu chibàworo n'ulo uku nile unu; 6 ebe ọ bu kwa umu Juda na umu Jerusalem ka unu nēre nye umu ndi Jevan, ka unu we me ka ha si n'ókè-ala-ha je n'ebe di anya: 7 le, M'gaje isi n'ebe ahu ebe unu nērega ha-ri kpọte ha, nyeghachi nmesò-unu n'isi-unu; 8 M'gēre kwa umu-unu ndikom na umu-unu ndinyom nye n'aka umu Juda, ha ewe re ha nye ndi Sheba, bú mba di anya: n'ihi na Jehova ekwuwo. 9 Kpọsanu nka n'etiti mba nile; donu agha nsọ: kpọtenu ndi-dike; ka ndi-agha nile biarue nso, rigota. 10 Kpugharianu mma-ọgè-unu ka ha buru mma-agha, na mma-ikwa-osisi-unu ka ha buru ube: ka onye-ume-ngwu si, Dike ka m'bu. 11 Menu ngwa, bia, unu mba nile ndi bi buruburu, chikọtanu onwe-unu: Jehova, me ka ndi-dike-Gi rida n'ebe ahu. 12 Ka mba nile teta, rigota na ndagwurugwu Jehoshafat: n'ihi na n'ebe ahu ka M'gānọdu ikpe mba nile bi buruburu ikpe. 13 Tiye mma-iwe-ihe-ubi, n'ihi na ihe agēwe n'ubi achawo: bianu, zọcha; n'ihi na ebe-nzọcha-nkpuru-vine ejuwo, ebe-inara-manya-vine nile erubigawo; n'ihi na ihe ọjọ ha bara uba. 14 Ọtutu ìgwè madu, ọtutu ìgwè madu nime ndagwurugwu nkpebì-ikpe! n'ihi na ubọchi Jehova di nso nime ndagwurugwu nkpebì-ikpe. 15 Anyanwu na ọnwa ejiwo nji, kpakpando achikọpuwo kwa onwunwu-ha. 16 Jehova gēsi kwa na Zaion bib͕ọ, me ka olu-Ya si na Jerusalem da; elu-igwe na uwa gēme kwa nkpatu: ma Jehova gāburu ndi-Ya ebe-nb͕abà, Ọ gābu-kwa-ra umu Israel ebe siri ike. 17 Unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Onye bi na Zaion, bú ugwu nsọm: Jerusalem ewe di nsọ, ndi ala ọzọ agaghi-agabiga kwa nime ya ọzọ. 18 Ọ gēru kwa n'ubochi ahu, na ugwu nile ganābusa manya-vine utọ, miri-ara ganērù kwa n'ugwu ntà nile, miri ganērù kwa n'ebe nile nke Juda miri si erù; isi-iyi gēsi kwa n'ulo Jehova puta, de ndagwurugwu Shitim. 19 Ijipt gāghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, Edom gāghọ kwa ọzara, bú ebe tọb͕ọrọ n'efu, n'ihi ihe-ike emere umu Juda, n'ihi na ha awusiwo ọbara nēmeghi ihe ọjọ n'ala-ha. 20 Ma Juda gābu ebe madu bi rue mb͕e ebighi-ebi, Jerusalem kwa rue ọb͕ọ na ọb͕ọ. 21 M'gāgu kwa ọbara-ha n'ihe ikpe nāmaghi, bú nke M'nāgughi ya n'ihe ikpe nāmagh: n'ihi na Jehova nēbi nime Zaion.

Emos 1

1 Okwu Emos, onye nọ n'etiti ndi-nche-anu-ulo nke Tekoa, nke ọ huru bayere Israel n'ubọchi Uzaia, bú eze Juda, na n'ubọchi Jeroboam nwa Joash, bú eze Israel, arọ abua tutu ala-ọma-jijiji. 2 Ọ we si, Jehova gēsi na Zaion bib͕ọ, me ka olu-Ya si na Jerusalem da; ebe-ita-nri nile nke ndi-ọzùzù-aturu ewe ru újú, elu Kamel gākpọnwu kwa. 3 Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Damaskọs, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na ha ewerewo ígwè eji azọcha ọka zọcha Gilead: 4 ma M'gēzite ọku n'ulo Hazael, ọ gēripia kwa ulo-elu nile nke Ben-hedad. 5 M'gētiji kwa nkpọrọ Damaskọs, si na ndagwurugwu Even bipu onye bi ya, si kwa n'ulo Eden bipu onye nējide nkpa-n'aka-eze: agēme kwa ka ndi Siria je biri n'ala ọzọ, bú Kia; otú a ka Jehova siri. 6 Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Geza, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na ha mere ka otù ndi je biri n'ala ọzọ, ha nile, imechibido ha nye n'aka Edom: 7 ma M'gēzite ọku n'elu mb͕idi Geza, ọ gēripia kwa ulo-elu-ya nile: 8 M'gēsi kwa n'Ashdad bipu onye bi ya, si kwa n'Ashkelon bipu onye nējide nkpa-n'aka-eze; M'gēchighari kwa akam imegide Ekron, ndi Filistia ndi fọduru gāla kwa n'iyì; otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri. 9 Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Taia, e, n'ihi anọ ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na ha mechibidoro otù ndi emere ka ha nile je biri n'ala ọzọ nye n'aka Edom, ha echetaghi kwa ọb͕ub͕a-ndu nke umu-nne: 10 ma M'gēzite ọku n'elu mb͕idi Taia, o gēripia kwa ulo-elu-ya nile. 11 Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Edom, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na o jiri mma-agha chu nwa-nne-ya, o bibi-kwa-ra obi-ebere-ya nile, iwe-ya we nādọka rue mb͕e ebighi-ebi, ma nrubiga-ókè nke iwe-Ya, o debewo ya mb͕e ebighi-ebi: 12 ma M'gēzite ọku na Timan, o gēripia kwa ulo-elu nile nke Bọzra. 13 Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke umu Amon, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi; n'ihi na ha ab͕awawo ndinyom Gilead di ime afọ ka ha we me ka ókè-ala-ha sa mbara: 14 ma M'gēsuye ọku na mb͕idi Raba, ọ gēripia kwa ulo-elu-ya nile, n'iti-nkpu agha n'ubọchi agha, n'oké ifufe n'ubọchi oké ikuku: 15 eze-ha gāla kwa n'etiti ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ya onwe-ya na ndi-isi-ya n'otù; otú a ka Jehova siri.

Emos 2

1 Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Moab, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na o surere ọkpukpu eze Edom me ka ha ghọ nzu: 2 ma M'gēzite ọku na Moab, o gēripia kwa ulo-elu nile nke Keriot; Moab gānwu kwa anwu na nkpọtu, na n'iti-nkpu agha, na n'olu opì-ike: 3 M'gēbipu kwa onye-ikpe n'etiti ya, b͕ue ya na ndi-isi-ya nile; otú a ka Jehova siri. 4 Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Juda, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na ha juworo iwu Jehova, ọ bu kwa ukpuru-Ya nile ka ha nēdebeghi, okwu-ugha-ha nile, nke ndi bu nna-ha jeroso, we dufue ha: 5 ma M'gēzite ọku na Juda, o gēripia kwa ulo-elu nile nke Jerusalem. 6 Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Israel, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na ha reworo onye ezi omume n'ọla-ọcha, re kwa ob͕eye n'ihi akpukpọ-ukwu abua: 7 ha bu ndi nēghekpọso ájá ala n'isi ndi nēnweghi ike, ọ bu kwa uzọ ndi di ume-ala n'obi ka ha nēwezuga: ọzọ, nwoke na nna-ya nējekuru otù nwa-ab͕ọghọ ahu, ka ha we me ka aha nsọm ghara idi nsọ: 8 ọ bu kwa n'elu uwe anaraworo n'ihe-ibe ka ha nēseti onwe-ha n'akuku ebe-ichu-aja nile ọ bula, ọ bu kwa manya-vine nke ndi eriworo ha nra ka ha nāṅu n'ulo Chineke-ha. 9 Ma Mu onwem kpochapuru ndi-Amorait n'iru ha, onye idi-elu-ya di ka idi-elu osisi cedar, onye di ike ka ọ bu kwa, dika osisi oak; ma ekpochapurum nkpuru-ya n'elu na nkpọrọgwu-ya nile n'okpuru. 10 Ọ bu kwa Mu onwem mere ka unu si n'ala Ijipt rigoputa, M'me-kwa-ra ka unu je ije n'ọzara ọgu arọ abua, ka unu we nweta ala ndi-Amorait. 11 Eme-kwa-ram ka ufọdu nime umu-unu bilie ibu ndi-amuma, ufọdu nime umu-okorọbia-unu kwa, ibu ndi-Nazirait. Ọ̀ bughi nọ̄ ezie, bú nka, unu umu Israel? Ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 12 Unu we me ka ndi-Nazirait ṅua manya-vine; ọ bu kwa ndi-amuma ka unu nyere iwu, si, Unu ebula amuma. 13 Le, Mu onwem gābiada unu n'ọnọdu-unu, dika ub͕ọ-ala nke juputara n'ùkwù ọka si abiada. 14 Ebe-nb͕alaga gālanari kwa onye ukwu ọsọ n'iyì, onye di ike agaghi-ab͕a kwa ike-ya ume, dike agaghi-ewepuga onwe-ya: 15 onye nāchi uta agaghi-eguzo kwa; onye ukwu-ya abua di nfe n'ib͕a ọsọ agaghi-ewepuga kwa onwe-ya: onye nānọkwasi n'inyinya agaghi-ewepuga kwa onwe-ya: 16 onye obi-ya nwere ume n'etiti ndi-dike gāb͕a ọtọ b͕alaga n'ubọchi ahu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

Emos 3

1 Nurunu okwu a nke Jehova kwuworo megide unu, umu Israel, megide ab͕uru ahu nile nke M'mere ka ha si n'ala Ijipt rigoputa, si, 2 Nání unu ka M'maworo n'etiti ab͕uru nile nke uwa: n'ihi nka ka M'gēji ajọ omume nile unu leta unu. 3 Màdu abua gāyikọta je ije, ma ọ buru na ha ezuteghi? 4 Ọdum, ọ̀ gāb͕ọ uja n'oké ọhia, mb͕e ọ dighi anu ọ nādọb͕u? nwa-ọdum, ọ̀ gēme ka olu-ya si n'ebe-obibi-ya da, ma ọ buru na o nwudeghi ihe? 5 Nnunu, ọ̀ gādabà n'ib͕udu di n'ala, ebe ọ nādighi ọnyà esiri ya? ib͕udu, ò gēsi n'ala kpọhiepu, ma o jideghi ihe ọ bula? 6 Àgāfù opì-ike n'obodo, ndi-ya aghara ima jijiji? ihe ọjọ, ọ̀ gādi n'obodo, ma Jehova emeghi ya? 7 N'ezie Onye-nwe-ayi Jehova agaghi-eme ihe, ma ọ buru na O kpugheghi ìzù nzuzo Ya nye ndi-orù-Ya, bú ndi-amuma-Ya. 8 Ọdum ab͕ọwo uja, ọ̀ bu onye nāgaghi-atu egwu? Onye-nwe-ayi Jehova ekwuwo, ọ̀ bu onye nāgaghi-ebu amuma? 9 Menu ka anuru ya n'elu ulo-elu nile n'Ashdod, na n'elu ulo-elu nile n'ala Ijipt, si, Zukọtanu n'elu ugwu nile nke Sameria, hu ọb͕ub͕a-aghara di ọtutu nke di n'etiti ya, na nmeb͕u di iche iche nke di nime ya. 10 N'ihi na ha amaghi ime ihe ziri ezi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), bú ndi nākpakọba ihe-ike na ipunara-madu-ihe n'ulo-elu nile ha. 11 N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Onye-nkpab͕u gādi, ọbuná buruburu ala-gi: ọ gēme kwa ka ike-gi danari gi, agāluta kwa ulo-elu gi nile n'agha. 12 Otú a ka Jehova siri: Dika onye-ọzùzù-aturu si anaputa ọlu-ukwu abua, ma-ọbu iberibe nti, n'ọnu ọdum; otú a ka agānaputa umu Israel ndi nānọdu ala nime Sameria na nkuku ihe-ndina, na n'elu nkisi ọma nke ebe anēdina. 13 Nurunu, b͕anu àmà imegide ulo Jekob; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, puta. 14 N'ihi na n'ubọchi M'gēji njehie nile nke Israel leta ya, n'ubọchi ahu ka M'gēji kwa nmehie ebe-ichu-àjà nke Bet-el leta ha, agēbipu kwa mpi nile nke ebe-ichu-àjà ahu, ha ewe da n'ala. 15 M'gēti kwa ma ulo mb͕e oyi ma ulo mb͕e okpom-ọku ihe; ulo nile nke ejiri ọdu wu gāla kwa n'iyì, ọtutu ulo gāgwusi kwa; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

Emos 4

1 Nurunu okwu a, unu nne-ehi nke Beshan, ndi nọ n'ugwu Sameria, ndi nēmeb͕u ndi nēnweghi ike, ndi nāzọpia umu-ob͕eye, ndi nāsi ndi-nwe-ha, Wetanu, ka ayi ṅua. 2 Onye-nwe-ayi Jehova ejiwo idi-nsọ-Ya ṅua iyi, si, na le, ubọchi nābiakwasi unu, mb͕e agāchiri nkò bupu unu, chiri kwa nkò azù bupu ndi-unu fọduru. 3 Ọ bu kwa ntipú-mb͕idi di iche iche ka unu gēsi pua, nwanyi ọ bula na ncherita-iru ya; unu gātubà onwe-unu na Hamon; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 4 Bianu na Bet-el, jehie; bianu na Gilgal, me ka njehie ba uba; chibata-kwa-nu ihe-àjà-unu kwa-ututu, chibata ihe nile bu otù uzọ n'uzọ iri unu kwa ubọchi atọ; 5 sure-kwa-nu àjà-ekele dika ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ site n'achicha ekoro eko, kpọsa-kwa-nu onyinye-afọ-ofufo di iche iche, me ka anuru ihe bayere ha: n'ihi na ihe di otú a ka unu huworo n'anya, umu Israel; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 6 Mu onwem kwa, enyewom unu ezé nwuru enwu n'obodo nile unu, na ukọ nri n'ebe nile unu: ma unu alaghachikuteghm; ọ bu ihe si n'ọnu jehova puta. 7 Ọzọ kwa, Mu onwem eb͕ochiworo unu oké miri-ozuzo, mb͕e ọnwa atọ fọduru iru mb͕e owuwe-ihe-ubi: eme-kwa-ram ka o zokwasi otù obodo, ma adighm-eme ka o zokwasi obodo ọzọ: otù òkè ala-ubi ka o nēzokwasi, ma òkè ala-ubi ahu nke ọ nādighi-ezokwasi nākpọnwu akpọnwu. 8 Obodo abua ma-ọbu atọ ewe ṅagharia rue otù obodo iṅu miri, ma ha adighi-aṅuju afọ: ma unu alaghachikuteghm; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 9 Ejirim nchakpọ, ji kwa ọmuma-ebù, tib͕ue unu: ka ha rà, bú ubi-unu ab͕ara ogige, na ubi-vine-unu, na osisi fig unu, na osisi olive unu, palmer-worm nērichapu ha: ma unu alaghachikuteghm; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 10 Ezitewom ajọ ọria nēfe efe n'etiti unu n'uzọ o si eme n'Ijipt: eb͕uwom umu-okorọbia-unu na mma-agha, ha na inyinya nile unu adọtara n'agha; M'we me ka ísì ọjọ nke ọmuma-ulo-ikwū-unu rigota ọbuná n'imi-unu: ma unu alaghachikuteghm; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 11 Akwatuwom ufọdu n'etiti unu, dika mb͕e Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra, unu we di ka ọlọkọ-ọku alọputara n'orire-ọku: ma unu alaghachikuteghm; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 12 N'ihi nka ka M'gēme gi otú a, gi Israel: ebe ọ bu nka ka M'gēme gi, jikere izute Chineke-gi, gi Israel. 13 N'ihi na, le, Onye nākpu ugwu nile, Nke nēkè kwa ifufe, Nke nēgosi kwa madu ihe bu ntughari-uche-ya, Onye nēme chi-ọbubọ ka ọ b͕a oké ọchichiri, Nke nāzọkwasi kwa ebe nile di elu nke uwa; Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bu aha-Ya.

Emos 5

1 Nurunu okwu a nke Mu onwem nēbuli n'isi unu ka ọ buru abù-ákwá, unu ulo Israel. 2 Nwa-ab͕ọghọ Israel nke nāmaghi nwoke adawo; ọ gaghi-ebili ọzọ: atusawo ya n'ala-ya; ọ dighi onye nēme ka o bilie. 3 N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Obodo ahu nke chiri nnù ndi-agha abua na ọgu iri apu gēnwe ọgu ise fọduru, nke chiri ọgu ise apu gēnwe kwa iri fọduru ulo Israel. 4 N'ihi na otú a ka Jehova siri ulo Israel, Chọnum, we di ndu: 5 ma unu achọla Bet-el, unu abà-kwa-la na Gilgal, unu agabiga-kwa-la ijeru Bia-sheba: n'ihi na aghaghi ime ka Gilgal je biri n'ala ọzọ, Bet-el gāghọ kwa ajọ ihe. 6 Chọnu Jehova, we di ndu; ka O we ghara ibia ike ike dika ọku n'ulo Josef, o we ripia, ọ gaghi-adi kwa onye nēmenyu ya nime Bet-el: 7 unu ndi nāb͕anwe ikpé ziri ezi ka ọ ghọ wormwood, ndi nātọb͕ọ kwa ezi omume n'ala; 8 chọnu Onye nēme Pleiades na Orion, Nke nāb͕anwe onyinyo ọnwu ka ọ ghọ ututu, Nke nēme kwa ka ehihie b͕a ọchichiri dika abali; Onye ahu Nke nākpọ miri nke oké osimiri òkù, we wusa ha ala; Jehova bu aha-Ya; 9 Onye ahu Nke nēme ka nbibi b͕ukwasi onye di ike dika àmùmà, nbibi ewe biakwasi ebe ewusiri ike. 10 Ha nākpọ onye nāba nba n'ọnu-uzọ-ama asì, ọ bu kwa onye nēkwu okwu n'izu-okè ka ha nākpọ onye-árú. 11 N'ihi nka, ebe unu nāzọb͕u onye nēnweghi ike, ebe unu nānara kwa ya ọka wheat n'ùtú: ulo nkume awara awa ka unu wuworo, ma unu agaghi-ebi nime ha; ubi-vine anāchọsi ike ka unu meworo, ma unu agaghi-aṅu manya-vine-ha. 12 N'ihi na amawom na ihe bara uba ka njehie-unu bu, na ihe di ike ka nmehie nile unu bu; unu ndi nākpab͕u onye ezi omume, ndi nānara ihe-nb͕aputa, ma ọ bu umu-ob͕eye di n'ọnu-uzọ-ama-unu ka unu nēwezuga n'ikpe-ha. 13 N'ihi nka onye nwere uche gēdere du n'oge ahu; n'ihi na oge ọjọ ka ọ bu. 14 Chọnu ezi ihe, achọ-kwa-la ihe ọjọ, ka unu we di ndu: Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, ewe si otú a nọnyere unu, otú unu siri. 15 Kpọnu ihe ọjọ asì, hunu ezi ihe n'anya, menu ikpé ziri ezi ka o guzosie ike n'ọnu-uzọ-ama: eleghi anya Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, gēmere ndi Josef fọduru amara. 16 N'ihi nka ka Jehova bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bú Onye-nwe-ayi, jiri si otú a: N'amá nile ka otiti-aka-n'obi gādi; ọ bu kwa n'èzí nile ka ha gāsi, Éwù! éwù! ha gākpọ kwa onye-ubi ibia iru-újú, kpọsa-kwa-ra ndi mara igu awa otiti-aka-n'obi. 17 Ọ bu kwa n'ubi-vine nile ka otiti-aka-n'obi gādi: n'ihi na M'gāgabiga n'etiti gi; otú a ka Jehova siri. 18 Ahuhu diri unu ndi nāchọsi ubọchi Jehova ike! ùrù gini ka ubọchi Jehova gābara unu? ubọchi ahu bu ọchichiri, ọ bughi ìhè. 19 Dika agāsi na otù onye nāb͕apu n'iru ọdum, anu-ọhia bear we zute ya; o we ba n'ulo-ya dabere aka-ya na mb͕idi, agwọ we ta ya. 20 Ọ̀ bughi ọchichiri ka ubọchi Jehova gābu, nke nābughi ìhè? ọ̀ gaghi-ab͕a kwa oké ọchichiri, nke onwunwu ọ bula nādighi ya? 21 Akpọwom ememe nile unu asì, ju ha, M'gaghi-anu kwa ísì utọ n'ubọchi-nb͕ochi nile unu. 22 N'ihi na ọ buru na unu esurerem àjà-nsure-ọku nile na onyinye-inata-iru-ọma nile unu, ha agaghi-atọm utọ: ọ bu kwa àjà-udo nke anu mara abuba nile unu ka M'nāgaghi-elegide. 23 Wezuga n'arum ùzù abù-gi nile; ọ bu kwa ọkpukpọ une-gi nile ka M'nāgaghi-anu. 24 Ma ka ikpé ziri ezi nērùdasi ike dika miri, ezi omume kwa dika miri-iyi nke nērù mb͕e dum. 25 Ọ̀ di àjà di iche iche na onyinye-inata-iru-ọma unu wetaram n'ọzara ọgu arọ abua, unu ulo Israel? 26 É-è, kama unu eburuwo ulo-ikwū nke eze-unu na Kaiun, bú onyinyo-unu, bú kpakpando nke chi-unu, nke unu mere onwe-unu. 27 M'gēme kwa ka unu je biri n'ala ọzọ n'ofè Damaskọs, ka Jehova, Onye aha-Ya bu Chineke nke usu nile nke ndi-agha, siri.

Emos 6

1 Ahuhu diri ndi nọ jū na Zaion, na ndi nwere ntukwasi-obi n'ugwu Sameria, ndi akpọrọ n'aha n'aha n'etiti isi mba nke mba nile, ndi ulo Israel biakuteworo! 2 Gabiganu rue Kalne, hu; si-kwa-nu n'ebe ahu jerue Hemat nke bara uba: rida-kwa-nu rue Gat nke ndi Filistia: hà di nma kari ala-eze ndia? ma-ọbu ókè-ala-ha, ò riri nne kari ókè-ala-unu? 3 Unu ndi nāchupu ubọchi ọjọ, ma unu nēme ka ọnọdu ihe-ike bia nso: 4 ndi nēdina n'elu ihe-ndina ọdú, nēseti kwa onwe-ha n'elu ebe-ndina-ha, nēri kwa umu-aturu ọma sitere n'ìgwè ewu na aturu, na umu-ehi site n'etiti ulo ebe anēme ka anu ma abuba; 5 ndi nābùso olu une abù efu; dika Devid ka ha zuputaworo onwe-ha ubọ-abù di iche iche; 6 ndi nāṅu manya-vine n'ọkwa-nwusa, ọ bu kwa manu kachasi nma ka ha ji ete onwe-ha; ma ha ariaghi ọria n'ihi nkpaji akpajiri Josef. 7 N'ihi nka ub͕u a ka agēme ka ha je biri n'ala ọzọ buru ndi-obu-uzọ nke ndi anēme ka ha je biri n'ala ọzọ, oriri ọkwukwa-ozu nke ndi nēseti onwe-ha gēwezuga kwa onwe-ya. 8 Onye-nwe-ayi Jehova ejiwo Onwe-ya ṅua iyi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, puta), si: Mu onwem nākpọ npako Jekob ihe-árú, ọ bu kwa ulo-elu-ya nile ka M'kpọworo asì: M'gēmechibido kwa obodo na ùjú-ya nye n'aka onye-iro. 9 Ọ gēru kwa, na ọ buru na ndikom iri fọduru n'otù ulo, na ha gānwu. 10 Ma mb͕e nwa-nne nna madu, bú onye-nsure-ọku-ya, gēburu ya ichipu ọkpukpu n'ulo, si onye nke nọ n'ime-ime-ulo nke ulo ahu, Ọ̀ di onye ọzọ gi na ya nọ? ọ gāsi, É-è; si kwa, Nọdu du; n'ihi na ayi agaghi-ehota aha Jehova. 11 N'ihi na, le, Jehova nēnye iwu, Ọ gētipiasi kwa ulo uku, ọ bu kwa ulo ntà ka Ọ gētiwasi. 12 Inyinya, hà nāb͕a ọsọ n'elu nkume di elu? àgēji ehi dọ ihe eji gwu ala-ubi n'ebe ahu? na unu ab͕anwewo ikpé ka ọ ghọ ńsí, b͕anwe kwa nkpuru ezi omume ka ọ ghọ wormwood: 13 unu ndi nāṅuri n'ihe nābughi ihe, ndi nāsi, Ọ̀ bughi ike nke aka ayi ka ayi jiworo natara onwe-ayi mpi di iche iche? 14 N'ihi na, le, M'gaje ime ka otù mba bilie imegide unu, unu ulo Israel; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, puta; ha gēmeb͕u kwa unu site na nbata Hemat rue iyi Araba.

Emos 7

1 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova mere ka m'hu: ma, le, Ọ nākpu igurube n'isi-nmalite nke opupú ahihia nke miri-ozuzo ikpe-azu; ma, le, ọ bu ahihia nke miri-ozuzo ikpe-azu mb͕e ebìsiri ahihia eze. 2 O rue, mb͕e ha ripiasiri ihe-ọkukú nile nke ala, na m'siri, Onye-nwe-ayi Jehova, biko, b͕aghara: Jekob, ò gēsi aṅa guzosie ike? n'ihi na onye ntà ka ọ bu. 3 Jehova chèghariri uche bayere nka: Ọ gaghi-adi, ka Jehova siri. 4 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova mere ka m'hu: ma, le, Jehova nākpọ òkù ka Ya na ndi-Ya kpe ikpe site n'ọku; o we ripia oké ob͕u-miri, we nēripia òkè a, bú ala Israel. 5 M'we si, Onye-nwe-ayi Jehova, biko, rapu: Jekob, ò gēsi aṅa guzosie ike? n'ihi na onye ntà ka ọ bu. 6 Jehova chèghariri uche bayere nka: Nka agaghi-adi kwa, ka Onye-nwe-ayi Jehova siri. 7 Otú a ka O mere ka m'hu: ma, le, Onye-nwe-ayi nēguzo Onwe-ya n'akuku mb͕idi ejiri opù eji atù mb͕idi lua, ọ bu kwa n'aka-Ya ka opù eji atù mb͕idi di. 8 Jehova we sim, Gini ka gi onwe-gi nāhu, Emos? M'we si, Opù eji atù mb͕idi; Onye-nwe-ayi we si, Le, M'gaje ido opù eji atù nb͕idi n'etiti ndim, bú Israel; M'gaghi-agabiga kwa nmehie-ha ọzọ: 9 ebe nile di elu nke Aisak gātọb͕ọ kwa n'efu, ebe nsọ nile nke Israel gāghọ kwa nkpọnkpọ ebe; M'gēji kwa mma-agha bilie imegide ulo Jeroboam. 10 Amazaia, bú onye-nchu-àjà Bet-el, we zigara Jeroboam, bú eze Israel, ozi, si, Emos ekekọtawo madu imegide gi n'etiti ulo Israel: ala apughi inagide okwu-ya nile. 11 N'ihi na otú a ka Emos siri, Site na mma-agha ka Jeroboam gānwu, aghaghi ime kwa ka Israel si n'ala-ya je biri n'ala ọzọ. 12 Amazaia we si Emos, Gi onye-ọhu-uzọ, je b͕alaga n'ala Juda, rie nri n'ebe ahu, ọ bu kwa n'ebe ahu ka i gēbu amuma: 13 ma ebu-kwa-la amuma ọzọ nime Bet-el: n'ihi na ebe nsọ nke eze ka ọ bu; ọzọ, ulo ala-eze ka ọ bu. 14 Emos we za, si Amazaia, Ọ dighi onye-amuma m'bu, ọ dighi kwa nwa onye-amuma m'bu; kama onye-nche-ehi ka m'bu, ya na onye nēdozi nkpuru osisi sycomore: 15 Jehova we wepum n'iso ìgwè ewu na aturu, O we sim, bú Jehova, Je, buere ndim, bú Israel, amuma. 16 Ma ub͕u a nuru okwu Jehova: Gi onwe-gi nāsi, Ebula amuma megide Israel, abusa-kwa-la okwu-gi dika miri-ozuzo megide ulo Aisak: 17 n'ihi nka ka Jehova siri otú a: Nwunye-gi ganākwa iko n'obodo, umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom gāda kwa site na mma-agha, agēji kwa eriri kèsa ala-gi; gi onwe-gi gānwu kwa n'ala ruru árú, aghaghi ime kwa ka Israel si n'ala-ya je biri n'ala ọzọ.

Emos 8

1 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova mere ka m'hu: ma le, otù nkata nkpuru-osisi nke mb͕e nghọkọta-nkpuru. 2 O we si, Gini ka gi onwe-gi nāhu, Emos? M'we si, Otù nkata nke nkpuru-osisi nke mb͕e nghọkọta-nkpuru. Jehova we sim, Ọgwugwu abiaruwo ndim, bú Israel, aru; M'gaghi-agabiga kwa nmehie-ya ọzọ. 3 Abù nile nke ulo uku Chineke gāghọ kwa ikwasi-ákwá-ike n'ubọchi ahu; (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta): ọtutu ka ozu di; n'ebe nile ọ bula ka etufuworo ha: nọdu du! 4 Nurunu nka, unu ndi nēkusi ume ike ilo ob͕eye, ndi nāchọ kwa ime ka ndi ala-unu ewedara n'ala kwusi, 5 si, Òle mb͕e ọnwa ọhu gāgabiga, ka ayi we re ọka? na ubọchi-izu-ike, ka ayi we cho ọka wheat? n'ime ka ọtùtù ephah di ntà, na ime ka ego shekel di uku, na ime ka ihe-ọtùtù aghughọ b͕agọrọ; 6 ib͕a ndi nēnweghi ike n'ọla-ọcha, na ib͕a ob͕eye n'ihi akpukpọ-ukwu abua, ọ bu kwa ọka wheat afuchapuru ka ayi gēre. 7 Jehova ejiwo npako Jekob ṅua iyi, si, Agaghm-echezọ ọlu nile ha ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi. 8 Ala, ọ̀ gaghi-ama jijiji n'ihi nka? onye ọ bula nke bi nime ya, ọ̀ gaghi-eru kwa újú? e, ọ gērujucha dika osimiri Nail; ọ gāmaghari amaghari kwa, tacha, dika osimiri Nail nke Ijipt. 9 Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), na M'gēme ka anyanwu da n'etiti-ehihie, M'gēme kwa ka uwa b͕a ọchichiri mb͕e chi bọchara abọcha. 10 M'gāb͕anwe kwa ememe nile unu ka ha ghọ iru-újú, na abù nile unu, ka ha ghọ abù-ákwá; M'gēme kwa ka ákwà-nkpe biakwasi n'úkwù nile, na isi-nkwọcha n'isi nile ọ bula; M'gēme kwa ya ka ọ di ka újú anēruru nwa-nwoke amuru nání ya, M'gēme kwa ka mb͕e ikpe-azu ya di ka ubọchi nēlu ilu. 11 Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), mb͕e M'gēzite oké unwu n'ala, ọ bughi oké unwu nke nri, ọ bughi kwa akpiri-ikpọ-nku miri, kama ọ bu nke inu okwu nile nke Jehova. 12 Ha gāṅaghari kwa site n'otù oké osimiri rue oké osimiri ọzọ, site kwa n'Ugwu we rue n'Ọwuwa-anyanwu; ha gāb͕aghari iru na azu ichọ okwu Jehova, ma ha agaghi-achọta ya. 13 N'ubọchi ahu ka umu-ab͕ọghọ mara nma ndi nāmaghi nwoke gāda #mbà, ha na umu-okorọbia, site n'akpiri-ikpọ-nku. 14 Ndi ji ikpe-ọmuma Sameria aṅu iyi, si, Chineke-gi nādi ndu, Dan; na, Uzọ Bia-sheba nādi ndu; ha gāda kwa, ghara ibili kwa ọzọ.

Emos 9

1 Ahurum Onye-nwe-ayi, ka Ọ nēguzo Onwe-ya n'akuku ebe-ichu-àjà-Ya: O we si, Tie isi-ogidi nile, ka nbata-uzọ nile we me nkpatu: tijisie ha n'isi ha nile; ma ndi-ikpe-azu nime ha ka M'gēji mma-agha b͕ue: onye-ha nke nāb͕alaga ab͕alaga agaghi-ab͕alaga; ọzọ, onye-ha nke nāb͕apu ab͕apu agaghi-ewepuga onwe-ya. 2 Ọ buru na ha egwubà n'ala-mọ, site n'ebe ahu ka akam gēwere ha; ọ buru kwa na ha arigorue elu-igwe, M'gēme ka ha si n'ebe ahu ridata. 3 Ọ buru kwa na ha ezobe onwe-ha n'elu Kamel, n'ebe ahu ka M'gāchọputa ha were ha; ọ buru kwa na ezonari ha anyam abua n'ala oké osimiri, site n'ebe ahu ka M'gēnye agwọ ahu iwu, o we ta ha. 4 Ọ buru kwa na ha ala nime ndọta-n'agha n'iru ndi-iro-ha, site n'ebe ahu ka M'gēnye mma-agha iwu, o we b͕ue ha: M'gātukwasi kwa ha anyam abua ime ha ihe ọjọ, ọ bughi ime ha ezi ihe. 5 Ọ bu kwa Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bu Onye nēmetu ala, o we b͕aze, ndi nile ndi bi nime ya ewe rue újú; ọ gērujucha kwa dika osimiri Nail, we tacha, dika osimiri Nail nke Ijipt; 6 Onye nēwu ime-ulo-elu-Ya nile n'elu-igwe, ma mbara-ígwé-Ya, n'elu uwa ka Ọ tọworo ntọ-ala-ya; Onye nākpọ miri nke oké osimiri òkù, we wusa ha n'ala; Jehova bu aha-Ya. 7 Ọ̀ bughi ndi di ka umu ndi Etiopia ka unu burum, unu umu Israel? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Ọ̀ bughi Israel ka M'meworo ka ha si n'ala Ijipt rigoputa, na ndi Filistia site na Kaftoa, na ndi Siria site na Kia? 8 Le, anya abua nke Onye-nwe-ayi Jehova di n'aru ala-eze a nke juputara na nmehie, M'gēkpochapu kwa ya n'elu uwa; nání na M'gaghi-ekpochapusi ulo Jekob; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 9 N'ihi na, le, Mu onwem gaje inye iwu, yọchaghari ulo Israel iru na azu n'etiti mba nile, dika esi ayọchaghari ọka nime nyọ, ma ọ dighi otù nkpuru-ọka gāda n'ala. 10 Site na mma-agha ka ndi-nmehie nile nke ndim gānwu, ndi nāsi, Ihe ọjọ ahu agaghi-erute ayi aru, ọ gaghi-abia kwa n'iru ayi n'akuku ọ bula. 11 N'ubọchi ahu ka M'gēguzobe ulo-ntu Devid ọtọ, bú nke dara ada, M'gēmechi kwa ntipú-ya nile; ọ bu kwa ebe-ya nile kwaturu akwatu ka M'gēguzobe ọtọ, wulie ya dika n'ubọchi nke mb͕e ebighi-ebi gara aga; 12 ka ha we nweta ndi Edom fọduru, na mba nile ndi akpọkwasiri aham; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, bú Onye nēme nka. 13 Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e onye-plough gēkwudo onye nēbì ọka, onye-nzọcha-nkpuru-vine gēkwudo kwa onye nāgha nkpuru-ọghigha; ugwu nile gēme ka manya-vine utọ nābusa, ugwu ntà nile gāb͕aze kwa. 14 M'gēme kwa ka ndim adọtara n'agha, bú Israel, lata, ha gēwu kwa obodo nile tọb͕ọrọ n'efu, biri nime ha; ha gāku kwa ubi-vine, ṅua manya-ha; ha gēme kwa ubi ab͕ara ogige, rie nkpuru-ha. 15 M'gāku kwa ha n'elu ala-ha, agaghi-eropu kwa ha ọzọ n'ala-ha nke M'nyeworo ha; otú a ka Jehova, bú Chineke-gi, siri.

Obadaia 1

1 Ọhù Obadaia. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri bayere Edom: Ayi anuwo ihe-ọnunu sitere n'ọnu Jehova, ezigawo kwa ukọ̀ n'etiti mba nile, si, Bilienu, ka ayi bilie imegide ya n'agha. 2 Le, ihe ntà n'etiti mba nile ka M'meworo gi ka i ghọ: ihe elelìworo anya nke-uku ka i bu. 3 Nganga nke obi-gi arafuwo gi, gi onye bi na nb͕awa nile nke nkume di elu, ebe di elu ka ebe-obibi-ya bu; onye nāsi n'obi-ya, Ònye gēme ka m'ridarue ala? 4 Ọ buru na i felie elu dika ugo, ọ buru kwa na ọ bu n'etiti kpakpando ka edoworo akwu-gi, n'ebe ahu ka M'gēme ka i si rida; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 5 Ọ buru na ndi-ori abiakute gi, ọ buru na ndi nāpunara madu ihe abia n'abali, (le otú alaworo gi n'iyì nke-uku! ) hà agaghi-ezu ihe gēzuru ha n'ori? ọ buru na ndi nāghọrọ nkpuru-vine abiakute gi, hà agaghi-aghọfọ nkpuru nke fọduru itutukọ? 6 Le otú achọputaworo ihe Isọ nke-uku! le otú anubigaworo ọku ókè n'obi inwe àkù-ya ezobere! 7 Rue ókè-ala ka ndi nile gi na ha nọ n'ọb͕ub͕a-ndu zipuworo gi: ndi gi na ha nọ n'udo arafuwo gi, nwe ike imegide gi; nri-gi ka ha nēme ka ọ buru ọnyà n'okpuru gi: ọ dighi nghọta di nime ya. 8 Ọ̀ bughi n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ka M'gēme ka ndi-amam-ihe la n'iyì pua n'Edom, me kwa ka nghọta la n'iyì pua n'ugwu Isọ? 9 Gi Timan, ndi-dike-gi gātu ujọ, ka ewe bipu onye ọ bula n'ugwu Isọ site n'ob͕ub͕u. 10 N'ihi ihe-ike emere nwa-nne-gi, bú Jekob, ka ihere gēkpuchi gi, agēbipu kwa gi rue mb͕e ebighi-ebi. 11 N'ubọchi i guzoro iche na ncherita-iru, n'ubọchi ndi ala ọzọ dọtara usu-ndi-agha-ya n'agha, mb͕e ndi mba ọzọ bata-kwa-ra n'ọnu-uzọ-ama-ya nile, fekwasi Jerusalem nzà, ọbuná gi onwe-gi nọ ka otù nime ha. 12 Ma elekwasila ubọchi nwa-nne-gi anya n'ubọchi emere ya ka ọ ghọ onye ala ọzọ, aṅu-kwa-la umu Juda n'ubọchi ila-n'iyì-ha; eme-kwa-la ka okwu-ọnu-gi di uku n'ubọchi ahuhu. 13 Abàla n'ọnu-uzọ-ama ndim n'ubọchi nhuju-anya-ha; gi onwe-gi elekwasi-kwa-la ihe ọjọ ha anya n'ubọchi nhuju-anya-ha, unu atukwasi-kwa-la aka n'àkù-ha n'ubọchi nhuju-anya-ha. 14 Eguzo-kwa-la n'abu-uzọ, ibipu ndi-ya b͕apuru ab͕apu; emechibido-kwa-la ndi-ya fọduru nye n'aka ndi-iro-ha n'ubọchi ahuhu. 15 N'ihi na ubọchi Jehova di nso n'isi mba nile: dika i meworo, otú a ka agēme gi; nmeso-gi gālaghachi n'isi-gi. 16 N'ihi na dika unu ṅuworo ihe n'ugwu nsọm, otú a ka mba nile gāṅu ihe mb͕e dum, e, ha gāṅu, loda kwa, we di ka ha akādighi. 17 Ma n'ugwu Zaion ka ufọdu ndi b͕apuru ab͕apu gādi, ọ gādi kwa nsọ; ulo Jekob gēnweta kwa ihe-nnweta nile ha. 18 Ulo Jekob gābu kwa ọku, ulo Josef gāghọ kwa ire-ọku, ma ulo Isọ gāghọ ahihia-ọka, ha gēre kwa ọku n'etiti ha, ripia ha: ọ dighi kwa onye fọduru afọdu ulo Isọ gēnwe; n'ihi na Jehova ekwuwo okwu. 19 Ndi Negeb gēnweta kwa ugwu Isọ; ndi ebe di ala ala gēnweta ndi Filistia: ha gēnweta kwa ọhia Efraim, na ọhia Sameria: Benjamin gēnweta kwa Gilead. 20 Usu-ndi-agha nka nke umu Israel emere ka ha je biri n'ala ọzọ, bú nke nọ n'etiti ndi Kenean rue Zarefat, na ndi Jerusalem emere ka ha je biri n'ala ọzọ, bú ndi nọ na Sefarad, ha gēnweta kwa obodo nile nke Negeb. 21 Ndi-nzọputa gārigota kwa n'ugwu Zaion ikpe ugwu Isọ ikpe; ọ bu kwa Jehova gēnwe ala-eze ahu.

Jona 1

1 Okwu Jehova we rue Jona nwa Amitai nti, si, 2 Bilie, jerue Nineve, bú obodo uku, ahu, kpọsa okwu megide ya; n'ihi na ihe ọjọ ha arigotawo n'irum. 3 Jona we bilie isi n'iru Jehova b͕alaga na Tashish, o we rida na Jafo, chọta ub͕ọ nke nēje Tashish: ọ we tua ùtú-ya, ba nime ya, iso ha biarue Tashish ipu n'iru Jehova. 4 Ma Jehova tubàra ifufe di uku n'oké osimiri, oke ifufe di uku we di n'oké osimiri, ewe chè na ub͕ọ gētiwa. 5 Ndi-ub͕ọ we tua egwu, we tikue, onye ọ bula chi-ya; ha we tufue ihe nile nke di n'ub͕ọ n'oké osimiri, ime ka ọ di kari nfe n'aru ha. Ma Jona ridarari n'ime-ime-ala ub͕ọ; o we dina ala, da n'oké ura. 6 Onye-isi nke ndi-ọ̀kà-ub͕ọ we biakute ya nso, si ya, Gini nēme gi, gi onye oké ura? bilie, kpọkue Chineke-gi, eleghi anya Chineke gēcheta ayi, ayi we ghara ila n'iyì. 7 Ha we sirita ibe-ha n'otù n'otù, Bianu, ka ayi fe nzà, ka ayi we mara n'ihi onye ihe ọjọ a ruworo ayi aru. Ha we fe nzà nzà we ma Jona. 8 Ha we si ya, Biko, gosi ayi n'ihi onye ihe ọjọ a ruworo ayi aru; òle ozi i nēje? ọ̀ bu kwa ole ebe i si bia? òle ala-gi? òle ndi i siri nime ha puta? 9 O we si ha, Onye-Hibru ka m'bu; ọ bu kwa Jehova, bú Chineke nke elu-igwe, ka m'nātu egwu Ya, bú Onye mere oké osimiri na ala-akọrọ. 10 Ndikom ahu we tua oké egwu, si ya, Gini bu ihe a i meworo? N'ihi na ndikom ahu mara na ọ bu n'iru Jehova ka ọ nēsi b͕alaga, n'ihi na o gosiri ha-ri. 11 Ha we si ya, Gini ka ayi gēme gi, ka oké osimiri we dajua ghara imakwasi ayi? n'ihi na oké osimiri nọ nāmali onwe-ya elu. 12 O we si ha, Bulienum, tubàm n'oké osimiri; oké osimiri ewe dajua ghara imakwasi unu: n'ihi na mu onwem amawo na ọ bu n'ihim ka oké ifufe di uku a nēfekwasi unu. 13 Ma ndikom ahu we nyasie ike inyaghachi ub͕ọ n'ala; ma ha apugh: n'ihi na oké osimiri nọ nāmali onwe-ya elu megide ha. 14 Ha we kpọkue Jehova, si, Biko, Jehova, biko, ekwela ka ayi la n'iyì n'ihi ndu nwoke a, etiyekwasi-kwa-la n'isi ayi ọbara nēmeghi ihe ọjọ: n'ihi na Gi onwe-gi, bú Jehova, emewo dika o si tọ Gi. 15 Ha we bulie Jona, tubà ya n'oké osimiri: oké osimiri we guzo ọb͕ub͕ọ-ya. 16 Ndikom ahu we tua egwu Jehova nke-uku, ha we chuara Jehova àjà, kwe nkwa di iche iche. 17 Jehova we guputa otù azù uku ilo Jona; Jona we nọ n'afọ azù ahu ubọchi atọ ehihie na abali.

Jona 2

1 Jona we si n'afọ azù ahu kpere Jehova, bú Chineke-ya, ekpere. 2 O we si, Esirim n'ahuhum kpọkue Jehova, O we zam; N'afọ ala-mọ ka m'siri tikue Ya, I nuru olum. 3 N'ihi na I tubàram nime miri di omimi, n'etiti oké osimiri nile, Osimiri dikwam buruburu; Ebili-miri-Gi nile na nmali-miri-Gi nile gabigara n'isim. 4 Mu onwem we si, Achupuwom n'iru anya-Gi abua; Otú ọ di, m'gēlegide kwa anya ọzọ n'ebe ulo uku Gi di nsọ di. 5 Miri b͕aram buruburu, rue nkpuru-obi; Ob͕u-miri dim buruburu; Achara-miri kukurum n'isi. 6 Rue ala ugwu nile ka m'ridara; Ala, ihe-ntuchi-ya nile kpachitaram rue mb͕e ebighi-ebi: Ma I mewo ka ndum si n'olùlù rigoputa, Jehova, bú Chinekem. 7 Mb͕e nkpuru-obim nēnweghi ike nimem, Jehova ka m'chetara: Ekperem we bakute Gi, ba n'ulo uku Gi di nsọ. 8 Ndi nāriba ihe-efu di iche iche nke nābughi ihe ama, Ebere-ha ka ha nārapu. 9 Ma mu onwem gēji olu ekele chuara Gi àjà; Ihe nke m'kweworo na nkwa ka m'gākwughachi. Nzọputa diri Jehova. 10 Jehova we gwa azù ahu okwu, o we b͕ọputa Jona n'ala-akọrọ.

Jona 3

1 Okwu Jehova we rue Jona nti nke ub͕ò abua, si, 2 Bilie, jerue Nineve, bú obodo uku ahu, kpọsara ya nkpọsa ahu nke Mu onwem nāgwa gi. 3 Jona we bilie, jerue Nineve, dika okwu Jehova si di. Ma Nineve bu obodo di uku ri nne, ije nke ubọchi atọ. 4 Jona we malite ibà n'obodo ije nke otù ubọchi, o we kpọsa, si, Ọ fọduru ọgu ubọchi abua, ewe kwatue Nineve. 5 Ndi Nineve we kwere na Chineke; ha we kpọsa obubu-ọnu, yiri ákwà-nkpe, site n'onye uku ha we rue onye ntà ha. 6 Okwu ahu we rute eze Nineve aru, ọ we si n'oche-eze-ya bilie, yipu uwe-nwuda-ya n'aru ya, kpuchie onwe-ya n'ákwà-nkpe, nọkwasi na ntu. 7 O we tie nkpu, kwusa nime Nineve site n'iwu eze na ndi uku ya, si, Ka madu na anumanu, ma ìgwè ehi ma ìgwè ewu na aturu, ghara idetu ihe ọ bula n'ọnu: ka ha ghara izù onwe-ha, ghara kwa iṅu miri: 8 ma ka ha kpuchie onwe-ha n'ákwà-nkpe, ma madu ma anumanu, ka ha kpọkusi kwa Chineke ike: ka ha chighari kwa, onye ọ bula ya pua n'uzọ ọjọ ya, na n'ihe-ike nke di n'ọbu-aka-ha. 9 Ònye mara? eleghi anya Chineke gēchighari, chègharia uche, si n'iwe-Ya di ọku chigharia, ka ayi we ghara ila n'iyì. 10 Chineke we hu ọlu nile ha, na ha siri n'uzọ ọjọ ha chigharia; Chineke we chègharia uche bayere ihe ọjọ ahu, nke O kwuru, si na Ọ gēme ha; O meghi kwa ya.

Jona 4

1 O we jọ Jona ajọ njọ nke-uku, iwe-ya ewe di ọku. 2 O we kpere Jehova, si, Biko, Jehova, Ǹka abughi okwum, mb͕e m'nānọ n'alam? N'ihi nka ka m'buru uzọ b͕alaga na Tashish: n'ihi na amaram na Gi onwe-gi bu Chineke nke bu onye-amara, onye-obi-ebere, Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ Nke nāba kwa uba n'ebere, Nke nēchèghari kwa uche bayere ihe ọjọ ahu I gēweta. 3 Ma ub͕u a, Jehova, biko, wepu ndum n'arum; n'ihi na ọ kam nma inwu ọnwu kari idi ndu. 4 Jehova we si, Ì nēme nke-ọma n'iwe iwe di ọku? 5 Jona we pua n'obodo, nọdu ala n'akuku Iru-anyanwu nke obodo, mere onwe-ya otù ulo-ntu n'ebe ahu, nọdu ala n'okpuru ya na ǹdò-ya, rue mb͕e ọ gāhu ihe gēme n'obodo. 6 Jehova, bú Chineke, we guputa otù ogili-ub͕a, me ka o tolite n'elu Jona, ka o we buru ǹdò n'elu isi-ya, inaputa ya n'ọnọdu ọjọ ya. Jona we ṅuria ọṅu nke-uku n'ihi ogili-ub͕a ahu. 7 Chineke we guputa otù ikpuru mb͕e chi bọrọ n'echi-ya, o we ribie ogili-ub͕a ahu, o we kpọnwua. 8 O rue, mb͕e anyanwu wara, na Chineke guputara otù ifufe Iru-anyanwu di ọku; anyanwu we tikwasi Jona n'isi, ike we gwusia ya, o we riọ Chineke ndu-ya ka ọ nwua, si, Ọ kam nma inwu ọnwu kari idi ndu. 9 Chineke we si Jona, Ì nēme nke-ọma n'iwe iwe di ọku bayere ogili-ub͕a ahu? Ọ si, Anameme nke-ọma n'iwe iwe di ọku rue ọnwu. 10 Jehova we si, Gi onwe-gi mere ogili-ub͕a nka ebere, bú ihe nke i nādọb͕ughi onwe-gi n'ọlu n'ihi ya, nke i nēmeghi kwa ka ọ di uku; nke tolitere n'otù abali, la kwa n'iyì n'otù abali: 11 Mu onwem kwa, M'gaghi-emere Nineve ebere, bú obodo uku ahu; nke ihe kari orú nnù madu uzọ iri-na-ise nọ nime ya, bú ndi nāmaghi nke bu aka-nri-ha na aka-ekpe-ha; na ọtutu anumanu?

Maika 1

1 Okwu Jehova nke ruru Maika, bú onye Moreshet, nti, n'ubọchi Jotam na Ehaz na Hezekaia, bú ndi-eze Juda, bú okwu nke ọ huru bayere Sameria na Jerusalem. 2 Nurunu, unu ndi nile di iche iche, unu nile; ṅa nti, gi uwa, na ùjú-ya: ka Onye-nwe-ayi Jehova ghọ onye-àmà n'etiti unu, bú Onye-nwe-ayi site n'ulo uku Ya di nsọ. 3 N'ihi na, le, Jehova nēsi n'ebe-Ya puta, Ọ gāridata kwa, zọkwasi ebe di elu nile nke uwa ukwu. 4 Ugwu nile gāb͕aze kwa n'okpuru Ya, agāb͕awa kwa ndagwurugwu nile, dika wax n'iru ọku, dika miri nke anāwuda n'ebe-nrida. 5 N'ihi njehie Jekob ka ihe a nile di, na n'ihi nmehie nile nke ulo Israel. Gini bu njehie Jekob? ọ̀ bughi Sameria? gini bu kwa ebe di elu nile nke Juda? hà abughi Jerusalem? 6 M'gēme kwa Sameria ka ọ ghọ obo-ihe nke ọhia, ka ọ ghọ kwa ebe akuru ubi-vine: M'gāwusi kwa nkume-ya nile nime ndagwurugwu, ọ bu kwa ntọ-ala-ya nile ka M'gēkpughe. 7 Ọ bu kwa arusi-ya nile apiri api ka agētipia, ọ bu kwa onyinye ikwa-iko ya nile ka agēsure n'ọku, ọ bu kwa arusi-ya nile ka M'gēme ebe tọb͕ọrọ n'efu: n'ihi na o siworo n'onyinye nwanyi nke nākwa iko chikọta ha, ọ bu kwa rue onyinye nwanyi nākwa iko ka ha gālaghachi. 8 N'ihi nka ka m'gēti aka n'obi, kwasie ákwá ike, jegharia buru onye yipuworo uwe b͕a ọtọ: m'gēme ikwa-ákwá dika nkita-ọhia, na iru-újú dika enyi-nnunu. 9 N'ihi na ihe nādighi ngwọta ka ntiputa-ọnyá nile bu: n'ihi na ọ biaruwo Juda; o rutewo ọnu-uzọ-ama ndim, rue Jerusalem. 10 Unu egosila ya na Gat, unu akwala ákwá ma-ọli: nime Bet-le-afra ka m'turuworo onwem n'ájá. 11 Gabigara onwe-unu, gi nwanyi bi na Shafia, n'ọtọ na ihere: nwanyi bi na Zeanan aputaghi; otiti-aka-n'obi nke Bet-izel gānapu unu ebe-nguzo-ya. 12 N'ihi na nwanyi bi na Marot echerewo inwe ezi ihe: n'ihi na ihe ọjọ esiwo n'ebe Jehova nọ ridarue ọnu-uzọ-ama Jerusalem. 13 Kegide ub͕ọ-ala n'inyinya ukwu ọsọ, gi nwanyi bi na Lekish: isi-nmalite nmehie ka ọ buru ada Zaion; n'ihi na ọ bu nime gi ka ahuru njehie nile nke Israel. 14 N'ihi nka ka i gēnye Moreshet-gat ihe-idu-ulo di iche iche: ulo nile nke Akzib gāghọrọ ndi-eze Israel miri-iyi nārafu arafu. 15 Ọzọ, onye-nnweta ka M'gēme ka ọ biakute gi, gi nwanyi bi na Maresha: rue Adulam ka nsọpuru Israel gābia. 16 Mere onwe-gi isi-nkwọcha, kọpu isi-gi n'ihi umu nke ihe-utọ-gi nile: me ka isi-nkwọcha-gi sa mbara dika nke udele; n'ihi na emewo ka ha si n'ebe i nọ je biri n'ala ọzọ.

Maika 2

1 Ahuhu diri ndi nēchèputa ajọ ihe, nālu kwa ihe ọjọ n'elu ihe-ndina-ha! n'ìhè nke ututu ka ha nēme ya, n'ihi na ọ di n'ike aka-ha. 2 Ha we tukwasi anya-uku n'ubi, nara ha n'ike; ha tukwasi anya-uku n'ulo, būru ha: ha emeb͕uwo kwa ma nwoke ma ulo-ya, bú onye ọ bula na ala-nketa-ya. 3 N'ihi nka ka Jehova siri otú a: Le, M'nēchè èchìchè ihe ọjọ megide ab͕uru nka, bú ihe ọjọ nke unu nāgaghi-ekopu olu-unu, unu agaghi-ejeghari kwa n'idi-elu; n'ihi na mb͕e ọjọ ka ọ bu. 4 N'ubọchi ahu ka agātu ilu megide unu, gosie ákwá ike, si: Apunarisiwo ayi ihe: òkè ndim ka Ọ nāb͕anwe: le ka O si ewepurum ya nke-uku! ọ bu onye nke nādaghachi azu ka Ọ nēkère ubi nile ayi. 5 N'ihi nka i gaghi-enwe onye nātu eriri-ọtùtù n'ala ruru madu n'ife-nzà nime nkpọkọta ndi Jehova. 6 Unu abusala okwu dika miri, otú a ka ha nābusa okwu. Ha agaghi-abusará ndia okwu: okwu-ha nke nētiye n'ọnọdu-ihere agaghi-ewezuga onwe-ha. 7 Gi ulo Jekob, àgāsi, Mọ nke Jehova, Ọ̀ rapuru ibu onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ? ihe ndia, hà bu omume-Ya? okwum nile, hà adighi-eme onye nējeghari n'ezi nma? 8 Ma nnyahuru ka ndim nēbili ọtọ ibu onye-iro: ọ bu n'uwe-nb͕okwasi ka unu nēyipucha uwe-nwuda n'aru ndi nāgabiga na ntukwasi-obi, bú ndi si n'agha echighari. 9 Ndinyom nke ndim ka unu nāchupu n'ulo ihe-utọ nile ha; umu-ntakiri-ha ka unu nānapu ebubem rue mb͕e ebighi-ebi. 10 Bilienu, la; n'ihi na nka abughi izu-ike-unu: n'ihi iru-árú nke nemebi emebi, ọbuná nmebi di irè. 11 Ọ buru na onye ọ bula nke nējeghari n'ifufe na okwu-ugha ekwu okwu-ugha, si, M'gābusara gi okwu dika miri bayere manya-vine, baye-kwa-ra ihe-ọṅuṅu nāba n'anya; ọ gābu kwa onye nābusara ndi nka okwu dika miri. 12 Gi Jekob, aghaghm ime ka ndi-gi nile zukọta; aghaghm ichikọta ndi Israel fọduru; n'otù ka M'gēdokọ ha dika ìgwè ewu na aturu nke Bọzra: dika ìgwè aturu n'etiti ebe-ita-nri-ya; ha gēme oké nkpọtu n'ihi uba madu. 13 Onye-ntipú ahu arigowo n'iru ha: ha etipúwo, we gabiga rue ọnu-uzọ-ama, pua na ya: eze-ha agabigawo kwa n'iru ha, Jehova kwa n'isi ha.

Maika 3

1 M'we si, Biko, nurunu, unu ndi-isi Jekob, na unu ndi-ikpe ulo Israel: ọ̀ bughi ihe diri unu, bú imara ikpé? 2 unu ndi nākpọ ezi ihe asì, ndi nāhu kwa ihe ọjọ n'anya; ndi nādọwapu ha akpukpọ n'aru, na anu-aru-ha n'ọkpukpu nile ha; 3 ndi nēri kwa anu-aru ndim; ọ bu kwa akpukpọ-aru-ha ka ha b͕aworo ha, ọ bu kwa ọkpukpu nile ha ka ha b͕ajisiworo: e, ha eb͕ubisiwo ha dika ihe agēsi n'ite, na dika anu n'etiti ite ọla. 4 Mb͕e ahu ka ha gētiku Jehova nkpu, ma Ọ gaghi-aza ha: Ọ gēzonari kwa ha iru-Ya na mb͕e ahu, dika ha meworo ka omume nile ha jọ njọ. 5 Okwu di otú a ka Jehova kwuru bayere ndi-amuma ahu ndi nēdufu ndim; ndi ji ezé-ha ata aru, we kpọ, si, Udo; ma onye ọ bula nke nādighi-etiye ihe n'ọnu-ha, ha ewe do agha nsọ megide ya; 6 N'ihi nka ka abali gādiri unu, unu ewe ghara ihu ọhù; ọchichiri gāb͕a-kwa-ra unu, unu ewe ghara iju ase; anyanwu gādakpute kwa ndi-amuma ahu, ubọchi ewe ji nji n'elu ha. 7 Ihere gēme kwa ndi-ọhù, ndi nāju ase gēnwe kwa iru-ihere; e, ha gēkpuchi eb͕ub͕ere-ọnu-elu-ha, ha nile: n'ihi na ọ dighi ọziza Chineke nāza. 8 Ma otú ọ di mu onwem juputara n'ike, bú Mọ nke Jehova, na ikpé, na idi-ike, igosi Jekob njehie-ya, na igosi Israel nmehie-ya. 9 Biko, nurunu nka, unu ndi-isi ulo Jekob, na unu ndi-ikpe ulo Israel, ndi nākpọ ikpé ziri ezi ihe-árú, ọ bu kwa izi-ezi nile ka ha nēme ka ọ b͕agọrọ ab͕agọ. 10 Ndi ji ọbara èwu Zaion, ji kwa ajọ omume ewu Jerusalem. 11 Ndi-isi-ya nēkpe ikpe n'ihi iri-ngo, ndi-nchu-àjà-ya nēzí ihe n'ihi ugwọ, ndi-amuma-ya nāju ase n'ihi ego: ma na Jehova ka ha nādabere, si, Jehova, Ọ̀ nọghi n'etiti ayi? ihe ọjọ agaghi-abiakwasi ayi. 12 N'ihi nka ka agēji plough gwu Zaion dika ubi n'ihi unu, Jerusalem gāghọ kwa obo-ihe obo-ihe, ugwu nke ulo ahu gādi kwa ka ebe di elu nke oké ọhia.

Maika 4

1 Ọ gēru kwa, n'ikpe-azu nke ubọchi ndia, na ugwu nke ulo Jehova ganēguzosi ike n'elu ugwu nile, agēbuli kwa ugwu ahu elu kari ugwu ntà nile; ndi di iche iche gērùbà nime ya dika osimiri. 2 Ọtutu mba gēje kwa, si, Bianu, ka ayi rigorue ugwu Jehova, ru kwa ulo Chineke nke Jekob; Ọ gēzí kwa ayi uzọ-Ya ufọdu, ayi gēje kwa ije n'okporo-uzọ-Ya nile: n'ihi na Zaion ka iwu gēsi puta, okwu Jehova gēsi kwa na Jerusalem puta. 3 Ọ gēkpe kwa ikpe n'etiti ọtutu ndi di iche iche, dozi-kwa-ra mba di iche iche nwere ume okwu-ha rue ebe di anya; ha gākpughari kwa mma-agha-ha nile ka ha buru mma-ọgè, na ube-ha nile ka ha buru mma-ikwa-osisi: mba agaghi-ebuli mma-agha megide mba, ha agaghi-amuta kwa agha ọzọ. 4 Ma ha gēbi, onye ọ bula n'okpuru osisi vine ya na n'okpuru osisi fig ya; ọ dighi kwa onye gēme ka ha ma jijiji: n'ihi na ọnu nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha ekwuwo okwu. 5 N'ihi na ndi nile di iche iche nējeghari, onye ọ bula n'aha nke chi-ya; ayi onwe-ayi ganējeghari kwa n'aha Jehova, bú Chineke-ayi, rue mb͕e nile ebighi-ebi. 6 N'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ka M'gēme ka nwanyi ahu nke nēje nsukwara-achi zukọta, ọ bu kwa nwanyi ahu nke achupuru achupu ka M'gāchikọta, ya na nwanyi nke M'meworo ihe ọjọ; 7 M'gēme kwa ka nwanyi ahu nke nēje nsukwara-achi ghọ ndi fọduru afọdu, M'gēme kwa ka nwanyi ahu nke emere ka ọ nọ n'ebe di anya ghọ mba nwere ume: Jehova gābu kwa eze-ha n'ugwu Zaion site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi. 8 Ma gi onwe-gi, ulo-elu nke ìgwè aturu, Ofel nke ada Zaion, gi ka ọ gābiakute; e, ọchichi anāchi mbu gābia, bú ala-eze nke diri ada Jerusalem. 9 Ub͕u a n'ihi gini ka i nētisi nkpu ike? Ọ̀ bu na eze adighi na gi? onye-ndum-ọdu-gi, ọ lawo n'iyì, na ihe-nb͕ali ejidewo gi dika nke nwanyi ime nēme? 10 Nāb͕ali, Jisie ike imuputa nwa, gi ada Zaion, dika nwanyi ime nēme: n'ihi na ub͕u a ka i gāpu n'obodo, biri n'ọhia, biarue Babilon; n'ebe ahu ka agānaputa gi; n'ebe ahu ka Jehova gāb͕aputa gi n'aka ndi-iro-gi. 11 Ma ub͕u a ọtutu mba achikọtawo onwe-ha imegide gi, ndi nāsi, Ka emerua ya, ka anya-ayi lekwasi kwa Zaion. 12 Ma ndi ahu amaghi èchìchè nile nke Jehova, ha aghọtaghi kwa ndum-ọdu-Ya: n'ihi na Ọ chikọtawo ha dika ùkwù-ọka n'ebe-nzọcha-ọka. 13 Bilie, zọcha, gi ada Zaion: n'ihi na mpi-gi ka M'gēme ka ọ ghọ ígwè, ọ bu kwa ukwu-gi ka M'gēme ka ha ghọ ọla: i gāzọpia kwa ọtutu ndi di iche iche: M'gēwezuga kwa urù-ha nye Jehova, wezuga kwa àkù-ha nye Onye-nwe uwa nka nile.

Maika 5

1 Ub͕u a ka i gēdo onwe-gi n'usu ndi nāpunara madu ihe, gi ada nke usu ndi nāpunara madu ihe: nnọchigide-n'agha ka ọ nọchigideworo ayi: ha gēji nkpa-n'aka tie onye-ikpe Israel na ǹtì. 2 Ma gi onwe-gi, Bet-lehem Efrata, nke di ntà idi n'etiti usu nile nke nnù abua na ọgu iri nke Juda, nime gi ka otù onye gēsi putaram ibu onye nāchi achi n'Israel; onye ọpupu-ya nile sitere na mb͕e ochie, site n'ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga. 3 N'ihi nka ka Ọ gārara ha nye, rue mb͕e nwanyi ime nēme gāmuwori nwa: umu-nne-ya ndi fọduru afọdu ewe laghachikute umu Israel. 4 Ọ gēguzo kwa, zùa ìgwè aturu-ya n'ike nke Jehova, na nbili-elu nke aha Jehova, bú Chineke-ya: ha gēbiri kwa; n'ihi na ub͕u a ka ọ gādi uku rue nsọtu nile nke uwa. 5 Onye a gābu kwa udo: mb͕e Asiria gābata n'ala-ayi, mb͕e ọ gāzọ kwa ukwu n'ulo-elu nile ayi, ayi gēme kwa ka ndi-ọzùzù-aturu asa na ndi-isi madu asatọ bilie imegide ya. 6 Ha gēji kwa mma-agha b͕uchapu ala Asiria na ala Nimrod n'ọnu-uzọ-ya nile: ọ gānaputa kwa ayi n'aka Asiria, mb͕e ọ gābata n'ala-ayi, mb͕e ọ gāzọ kwa ukwu n'ókè-ala-ayi. 7 Ndi Jekob fọduru gādi kwa n'etiti ọtutu ndi di iche iche dika igirigi sitere n'ebe Jehova nọ, dika aburubu-miri n'elu ihe-ọkukú; nke nādighi-ele anya onye ọ bula, nke nādighi-echere kwa umu madu. 8 Ndi Jekob fọduru gādi kwa n'etiti mba nile, n'etiti ọtutu ndi di iche iche, dika ọdum n'etiti anumanu nke oké ọhia, dika nwa-ọdum n'etiti ìgwè ewu na aturu nile: nke gābu, mb͕e ọ gāgabiga, ọ gāzọda, dọkasia, ọ dighi kwa onye-nnaputa di. 9 Ka aka-gi di elu imegide ndi nākpab͕u gi, ka ebipu kwa ndi-iro-gi nile. 10 Ọ gēru kwa n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na M'gēbipu inyinya-gi nile n'etiti gi, me ka ub͕ọ-ala-gi nile la n'iyì: 11 M'gēbipu kwa obodo nile nke ala-gi, kwatue ebe-gi nile ewusiri ike: 12 M'gēbipu kwa n'aka-gi mb͕asi nile; i gaghi-enwe kwa ndi ji igwe-oji atù isi ọma na isi ọjọ: 13 M'gēbipu kwa arusi-gi nile apiri api na ogidi-gi nile n'etiti gi; i gaghi-akpọ kwa isi ala nye ọlu aka-gi ọzọ. 14 M'gēropu kwa Asherim-i n'etiti gi: M'gēkpochapu kwa ndi-iro-gi nile. 15 M'gābọ̀ kwa ọ́bọ̀ n'iwe na n'ọnuma n'aru mba nile ndi nānughi olum.

Maika 6

1 Biko, nurunu ihe Jehova nāsi: Bilie, je ikpe n'iru ugwu nile, ka ugwu ntà nile nu kwa olu-gi. 2 Unu ugwu, nurunu okwu ikpe Jehova; nu-kwa-nu, unu ntọ-ala uwa nke nādigide mb͕e nile: n'ihi na Jehova na ndi-Ya nēkperita ikpe, ọ bu kwa Israel ka Ọ gāruso uka. 3 Ndim, gini ka M'meworo gi? ọ̀ bu kwa gini ka M'jiworo me ka ike gwu gi? b͕a àmà megidem. 4 N'ihi na M'mere ka i si n'ala Ijipt rigoputa, ọ bu kwa n'ulo ndi-orù ka M'b͕aputara gi; M'we ziga Moses na Eron na Miriam iga n'iru gi. 5 Ndim, biko, cheta ihe Belak, bú eze Moab, b͕ara n'ìzù, na ihe Belam nwa Beoa zara ya; cheta site na Shitim rue Gilgal, ka unu we mara ezi omume nile nke Jehova. 6 M'gēji gini bia n'iru Jehova, rube isi n'iru Chineke di elu? #m'gābia n'iru Ya chiri ihe àjà-nsure-ọku, chiri umu-ehi b͕ara otù arọ? 7 Ọ̀ gātọ Jehova utọ, bú nnù kwuru nnù ebulu ma-ọbu orú nnù kwuru orú nnù iyi manu? #m'gēnye ọkparam n'ihi njehiem, nkpuru afọm n'ihi nmehie nkpuru-obim? 8 Gi madu, O gosiwo gi ihe di nma; ọ̀ bu kwa gini ka Jehova nāchọ n'aka-gi, ma-ọbughi nání ime ihe ekpere n'ikpe, na ihu ebere n'anya, na iji obi-ume-ala soro Chineke-gi nēje ije? 9 Olu Jehova nākpọ obodo òkù, onye-nzube-ihe gāhu kwa aha-Gi: nurunu nkpa-n'aka, na Onye kaworo ya. 10 Ọ̀ di àkù nmebi-iwu fọduru n'ulo onye-nmebi-iwu, ma-ọbu ephah nērughi eru nke nākpasu Chineke oké iwe? 11 M'gādi ọcha n'obi mb͕e m'nwere ihe-ọtùtù nmebi-iwu, mb͕e m'nwe-kwa-ra akpa nkume-ọtùtù aghughọ? 12 N'ihi na ndi-ọgaranya-ya juputara n'ihe-ike, ndi bi nime ya ekwuwo kwa okwu-ugha, ire-ha di kwa aghughọ n'ọnu-ha. 13 Ọzọ kwa, Mu onwem etiputawom i ọnyá jọb͕uru onwe-ya; emewom i ka i tọb͕ọrọ n'efu n'ihi nmehie-gi nile. 14 Gi onwe-gi gēri ihe, ma afọ agaghi-eju gi; afọ-awọrọ-gi gādigide kwa nime gi: i gēwezuga kwa ndi-gi, ma i gaghi-eme ka ha b͕apu; ma ndi i nēme ka ha b͕apu, ọ bu mma-agha ka M'gēwere ha nye. 15 Gi onwe-gi gāgha nkpuru, ma i gaghi-ewe ihe-ubi: gi onwe-gi gāzọcha nkpuru osisi olive, ma i gaghi-ete manu n'aru gi; i gāzọchapu kwa manya-vine ọhu, ma i gaghi-aṅu manya-vine. 16 N'ihi na anēdebe ukpuru nile nke Ọmri, na ọlu nile nke ulo Ehab, unu ewe jeghari nime ndum-ọdu nile ha: ka M'we me gi ka i ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, me kwa ndi bi nime-ya ka ha ghọ ihe-ima-ọsọ; ọ bu kwa ita-uta ndim ka unu gēbu.

Maika 7

1 Ahuhu dirim! n'ihi na Adiwom ka mb͕e ha ghọkọtaworo nkpuru nke mb͕e nghọkọta-nkpuru, dika ntutukọ nkpuru ubi-vine fọduru nke ọghughọ-nkpuru-vine: ọ dighi otù uyọkọ nkpuru-vine fọduru iri; nkpuru-osisi fig nke buru uzọ cha ka nkpuru-obim chọsiworo ike. 2 Onye-ebere alawo n'iyì pua n'uwa, ọ dighi kwa onye ziri ezi n'etiti madu: ha nile nēche anwu ọbara; ha ji ub͕u achu ntá, onye ọ bula nwa-nne-ya. 3 Ọ bu n'elu ihe ọjọ ka ọbu-aka-ha abua di ime ya nke-ọma; onye-isi nāriọ, onye-ikpe ewe jikere n'ihi ugwọ; onye uku kwa, onye nēkwu ihe-ila-n'iyì nke nkpuru-obi-ya ka ọ bu: ha we tukọta ya dika udọ̀. 4 Onye nke ha nke kachasi nma di ka uke: onye ziri ezi jọrọ njọ kari ogige ogwu: ubọchi ndi-nche-gi, bú nleta-gi, abiawo; ub͕u a ka mb͕e ib͕a ha ghari gādi. 5 Unu ekwerela n'eyì, unu atukwasila eyì unu mara nke-ọma obi: debe eb͕ub͕ere-ọnu-gi ghara igwa nwanyi nēdina n'obi-gi okwu. 6 N'ihi na nwa-nwoke nākpọ nna-ya onye-nzuzu, nwa-nwanyi nēbili imegide nne-ya, nwunye nwa imegide nne di-ya; ndi-iro madu bu ndi ulo-ya. 7 Ma mu onwem, nime Jehova ka m'gēche nche nke-ọma; M'gēchere Chineke nke nzọputam: Chinekem gānu olum. 8 Aṅulam ọṅu, gi onye-irom: mb͕e m'dara ada, m'bilie; mb͕e m'nānọdu n'ọchichiri, Jehova gāburum ìhè. 9 Iwe di ọku nke Jehova ka m'gēbu, n'ihi na emehiewom megide Ya; rue mb͕e Ọ gēkpe ọnum, me ihe ekpere n'ikpem, Ọ gēme ka m'puta n'ìhè, m'gēlekwasi kwa ezi omume-Ya anya. 10 Nwanyi-irom gāhu kwa ya, ihere ewe kpuchie ya iru; bú onye nāsim, Òle ebe Jehova, bú Chineke-gi, nọ? Anyam abua gēlekwasi ya; ub͕u a ka ọ gāghọ ihe-nzọtọ dika apiti nke èzí. 11 Ubọchi ib͕a ogige-gi nile gādi! n'ubọchi ahu ka ókè-gi gādi n'ebe di anya. 12 N'ubọchi ahu ọ bu kwa gi ka agābiakute, site n'Asiria na obodo nile nke Ijipt, site kwa n'Ijipt we rue Osimiri, site kwa n'oké osimiri rue oké osimiri, site kwa n'ugwu rue ugwu. 13 Ma ala nka gāghọ, ebe tọb͕ọrọ n'efu n'ihi ndi bi nime ya, site na nkpuru nke omume nile ha. 14 Were nkpa-n'aka-Gi zùa ndi-Gi, bú ìgwè ewu na aturu nke ihe-nketa-Gi, ndi bi iche, n'oké ọhia n'etiti Kamel: ka ha ta nri nime Beshan na Gilead, dika n'ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga. 15 Dika n'ubọchi i siri n'ala Ijipt puta, otú a ka M'gēme ka ọ hu oké ọlu di iche iche. 16 Mba di iche iche gāhu ya, ihere idi-ike-ha ewe me ha: ha gātukwasi aka n'ọnu, nti-ha gēchi. 17 Ha gāracha ájá dika agwọ; dika ihe di iche iche nke nākpu akpu nke ala, otú a ka ha gēwere ima-jijiji si n'ebe-nmechibido nile ha puta: Jehova, bú Chineke-ayi, ka ha gābiakute n'oké egwu, ha gātu kwa egwu gi. 18 Ònye bu Chineke dika Gi, Nke nēbupu ajọ omume, nāgabiga kwa njehie nke diri ndi ala-nketa-Ya fọduru? O jigideghi iwe-Ya rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi na onye ebere nātọ utọ ka Ọ bu. 19 Ọ gēchighari, nwe obi-ebere n'aru ayi; Ọ gāzọda ajọ omume nile ayi: I gātubà kwa nmehie nile ha n'ebe dikarisiri omimi nke oké osimiri. 20 I gēnye Jekob ezi-okwu, me-kwa-ra Abraham ebere, bú nke I ṅuworo nna-ayi-hà n'iyi site n'ubọchi nile nke mb͕e ochie.

Nehum 1

1 Ibu eboro Nineve. Akwukwọ ọkù nke Nehum, bú onye Elkosh. 2 Chineke ekworo, Nke nābọ̀ kwa ọ́bọ̀, ka Jehova bu; onye-ọ́bọ̀ ka Jehova bu, Ọ bu kwa onye-nwe ọnuma; onye-ọ́bọ̀ ka Jehova bu n'aru ndi nēmegide Ya, onye nēdebere ndi-iro-Ya iwe ka Ọ bu. 3 Jehova adighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ di kwa uku n'ike, ma ọ dighi uzọ ọ bula Ọ gāgu ndi ikpe mara na ha bu ndi ikpe nāmagh: Jehova, n'oké ikuku na n'oké ifufe ka uzọ-Ya di, igwe-oji bu kwa ájá ukwu-Ya abua. 4 Ọ nābasiri oké osimiri nba ike, me ka ọ ta, ọ bu kwa osimiri nile ka O meworo ka ha takọrọ: Beshan nātalata, ya na Kamel, ihe-opupú nke Lebanon nātalata kwa. 5 Ugwu nile emewo nkpatu site na Ya, ugwu ntà nile ab͕azewo kwa; ala we bulie onwe-ya site n'iru Ya, e, elu-uwa dum madu bi na ndi nile bi nime ya. 6 Ònye gēguzo n'iru oké iwe-Ya? ọ̀ bu kwa onye gēguzosi ike n'idi-ọku nke iwe-Ya? awusiwo ọnuma-Ya dika ọku, akwatuwo kwa oké nkume nile site na Ya. 7 Jehova di nma, Ọ bu ebe ewusiri ike n'ubọchi ahuhu; Ọ bu kwa onye nāma ndi nāgbabà nime Ya. 8 Ma Ọ gēji miri nke nērubiga ókè nke nērubiga erubiga me ka ọnọdu obodo ahu gwusia, ọ bu kwa ndi-iro-Ya ka Ọ gāchubà n'ọchichiri. 9 Gini ka unu nēchè megide Jehova? Ya onwe-ya nēme ka ọ gwusia: nkpab͕u agaghi-ebili nke ub͕ò abua. 10 N'ihi na ọ bu ezie na ha di ka ogwu tuhiri atuhi, buru kwa ndi ṅubigaworo manya ókè dika n'iṅubiga-manya-ókè-ha, ọku gēripia ha dika ahihia-ọka kpọnwusiri akpọnwu. 11 Nime gi ka otù onye siri puta, nke nēchè ihe ọjọ megide Jehova, nādu kwa ọdu ihe jọb͕uru onwe-ya. 12 Otú a ka Jehova siri: Ọ bu ezie na ha zuru okè, ba kwa uba otú a, ọbuná otú a ka agēb͕utu ha, ọ gāgabiga kwa. Ọ bu ezie na ewedawom i n'ala, ma M'agaghi-eweda kwa gi n'ala ọzọ. 13 Ma ub͕u a ka M'gāb͕ajipu nkpọrọ yoke-ya n'olu-gi, ọ bu kwa ab͕u-gi nile ka M'gētibi. 14 Jehova enyewo kwa iwu bayere gi, ka aghara igha kwa nkpuru ọ bula ọzọ nke sitere n'aha-gi: n'ulo chi-gi nile ka M'gēbipu arusi apiri api na arusi awuru awu; M'gēdo ílì-gi; n'ihi na elelìwo gi anya. 15 Le, n'elu ugwu ka ukwu nke onye n'ezisa ozi ọma di, bú onye nēme ka anuru okwu udo! Me ememe-gi nile, gi Juda, Kwughachi nkwa nile i kwere: n'ihi na onye jọb͕uru onwe-ya agaghi-agabiga kwa nime gi ọzọ; ebipusiwo ya.

Nehum 2

1 Onye-nchusa arigotawo n'iru-gi: chebe ebe ewusiri ike, che uzọ nche, me ka úkwù-gi sie ike, b͕a ike ume nke-uku. 2 N'ihi na Jehova neme ka nbili-elu nke Jekob lata, dika nbili-elu nke Israel: n'ihi na ndi-nwusi awusiwo ha dika miri, ọ bu kwa ngalaba-vine nile ha ka ha bibiworo. 3 Ọta ndi-dike-ya bu ihe esijiri ọbara-ọbara, ndi-dìnkpà-ya yiri uwe nācha uhie uhie: ígwè nēb͕upu eb͕upu ka ub͕ọ-ala-ya nwere n'ubọchi ndozi-ya, emewo ka osisi fir nile me nkpatu nke-uku. 4 N'èzí nile ka ub͕ọ-ala nile kpọtuworo nkpọtu nke-uku, ha nāb͕aghari iru na azu n'amá nile: ha di ka ọwa nēnwu enwu n'ile ha anya, dika àmùmà ka ha nāb͕a ọsọ. 5 Ọ nēcheta ndi-ebube-ya: ha su ngọngọ n'ojije-ha, me ngwa ijeru mb͕idi obodo, ma edoziwo ihe-nkpuchi ndi nānọchigide ya n'agha. 6 Emeghewo ọnu-uzọ-ama nile nke osimiri nile, ab͕azewo ulo uku ya. 7 Ekpughewo kwa Huzab, me ka ọ rigopu, ndi-orù-ya ndinyom nākwa kwa ákwá dika olu nduru, nēti obi-ha aka. 8 Ma Nineve di ka ọdọ-miri juputara na miri site n'ubọchi nile ya onwe-ya di: ma ndi ahu nāb͕alaga; Guzonu, guzonu, ka ha nāsi; ma ọ dighi onye nāgha anya n'azu. 9 Lutanu ọla-ọcha n'agha lutanu ọla-edo n'agha: ọ dighi kwa ọgwugwu diri àkù edoziri edozi, bú ebube nke sitere n'ihe nile anāchọsi ike. 10 Ọ bu ihe tọb͕ọrọ n'efu, na ihe awusiri dika miri, na ihe ab͕abara ọtọ: obi alọwo kwa miri, isu-ngọngọ nke ikperè abua di kwa, nb͕ali di kwa n'úkwù nile, iru ha nile achagharisiwo kwa. 11 Òle ebe ebe-obibi ọdum di? ebe-ita-nri ka ọ bu-kwa-ra umu-ọdum, ebe ọdum na nne-ọdum na nwa-ọdum jeghariri, ọ dighi kwa onye nēme ka ha ma jijiji. 12 Ọdum nādọb͕u anu gēzuru umu-ya, ọ nātọb͕uta-kwa-ra nne-ọdum-ya nile anu, we kpojue ọb͕à-ya nile n'anu-ndọb͕u, kpoju kwa ebe-obibi-ya nile n'anu ọ dọb͕uworo. 13 Le, Mu nēmegide gi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), M'gēsure kwa ub͕ọ-ala-ya n'anwuru-ọku, ọ bu kwa umu-ọdum-i ka mma-agha gēripia: M'gēbipu kwa anu-ndọb͕u-gi n'uwa, agaghi-anu kwa olu ndi-ozi-gi ọzọ.

Nehum 3

1 Ahuhu diri obodo ọbara! o juputasiri n'okwu-ugha na ndọka; ndọb͕u-anu adighi-apu na ya. 2 Ge nti olu utali, na olu nke ùzù wheel; na inyinya nāwuli awuli, na ub͕ọ-ala nāmali amali; 3 na onye-inyinya nēme ka inyinya-ya rigo, na mma-agha nēb͕upu eb͕upu, na ube nēb͕u àmùmà; na ọtutu ndi eb͕uru eb͕u, na oké obo ozu; ọ dighi kwa ọgwugwu diri ozu-ha; ha nāsu ngọngọ n'ozu-ha: 4 n'ihi iba-uba nke ikwa-iko nile nke nwanyi nākwa iko onye mara nma nke-uku, bú nwanyi nwe mb͕asi di iche iche, nke nēre mba di iche iche site n'ikwa-iko-ya nile, na ab͕uru di iche iche site na mb͕asi-ya nile. 5 Le, Mu nēmegide gi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), M'gēkpughe kwa ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-gi n'iru-gi, me ka mba nile hu ọtọ-gi, na ala-eze nile ka ha hu ihere-gi. 6 M'gātukwasi kwa gi ihe-árú di iche iche, M'gākpọ kwa gi ihe-nzuzu, do gi ka ihe ile anya. 7 O gēru kwa, na ndi nile ndi nāhu gi gāb͕anari gi, si, Ebibiwo Nineve: ònye gēgosi ya ebere o ji n'aru ya? Òle ebe M'gāchọputara gi ndi-nkasi-obi? 8 Ì di nma kari No-amon, nke bi n'etiti osimiri Nail nile, nke miri di ya buruburu; nke ékpè-ya bu oké osimiri, oké osimiri ka mb͕idi-ya sitere? 9 Etiopia bu ume-ya, ya na Ijipt, ọ dighi kwa ọgwugwu diri ya; Put na Lubim buri ndi-iye-aka-gi. 10 Ọbuná obodo ahu ka emere ka ọ je biri n'ala ọzọ, ọ lara na ndọta-n'agha: atupia-kwa-ra umu-ya nāṅu ara n'isi èzí nile: ọ bu kwa ndi di nsọpuru ya ka ha fekwasiri nzà, eke-kwa-ra ndi uku ya nkpọrọ. 11 Gi onwe-gi gāṅubiga kwa manya ókè, i gābu onye zoro ezo; gi onwe-gi gāchọ kwa ebe siri ike, n'ihi onye-iro. 12 Ebe-gi nile ewusiri ike gādi ka osisi fig nwere nkpuru-osisi fig buru uzọ cha: ọ buru na arùru ha arù, ha adabá n'ọnu onye nēri ha. 13 Le, ndi-gi bu ndinyom n'etiti gi; ndi-iro-gi ka emeghepusiworo ọnu-uzọ-ama nile nke ala-gi nye: ọku eripiawo ihe-ntuchi-gi nile. 14 Sere onwe-gi miri nke nnọchigide-n'agha, me ka ebe-gi nile ewusiri ike sie ike: ba n'urọ, zọta ájá, jide ihe eji akpu brick. 15 N'ebe ahu ka ọku gēripia gi; mma-agha gēbipu gi, ọ gēripia gi dika ukpala: me onwe-gi ka i rie nne dika ukpala, me onwe-gi ka i rie nne dika igurube. 16 I mewo ka ndi-ahia-gi ba uba kari kpakpando nke elu-igwe: ukpala enwopuwo iwere-ya, felaga. 17 Ndi-gi ekpubeworo okpu-eze di ka igurube, ndi-ọchi-agha-gi di kwa ka ìgwè igurube, ndi nēbe n'ogige ab͕ara ab͕a n'ubọchi juru oyi, ma mb͕e anyanwu wara ha felaga, amaghi kwa ọnọdu-ha ebe ha nọ. 18 Ndi-ọzùzù-aturu-gi atuwo òrù-ura, gi eze Asiria: ndi-ebube-gi nwere ebe-obibi-ha n'ájá: ndi-gi ab͕asawo n'elu ugwu nile, ọ dighi kwa onye-nchikọta ha nwere. 19 Ọ dighi nbilata nb͕aji ab͕ajiri gi nwere; ntiputa-ọnyá-gi jọrọ njọ: ndi nile ndi nānu ihe-ọnunu bayere gi gākukpo gi aka-ha; n'ihi na ònye ka ihe ọjọ gi nāgabigaghi n'isi-ya mb͕e dum?

Habakuk 1

1 Ọhu nke Habakuk, bú onye-amuma, huru. 2 Jehova, rùe ole mb͕e ka m'ganētiku Gi, ma I dighi-anu? m'nētiku Gi nkpu, si, Ihe-ike! ma I dighi-azọputa. 3 N'ìhi gini ka I nēme ka m'hu ajọ ihe? n'ìhi gini ka I nēlegide nmeb͕u? ma ipunara-madu-ihe ma ihe-ike di n'irum: ilu-ọ̀gù we di, esem-okwu nēbuli kwa onwe-ya. 4 N'ihi nka ka iwu nēsinwu, ikpe ziri ezi adighi-aputa kwa rue mb͕e ebighi-ebi: n'ihi na onye nēmebi iwu nāb͕a onye ezi omume buruburu; n'ihi nka ka ikpé nāputa buru ihe b͕agọrọ ab͕agọ. 5 Hunu n'etiti mba nile, legide-kwa-nu, ka o ju kwa unu anya nke-uku nke-uku: n'ihi na ọlu ka M'nālu n'ubọchi-unu, nke unu nāgaghi-ekwe, mb͕e agākọrọ unu ya. 6 N'ihi na, le, M'gaje ime ka ndi Kaldea bilie, bú mba ahu di ilu nke nēme kwa ngwa ngwa; ndi nējeghari na mbara uwa, inweta ebe-obibi di iche iche nke nābughi nke ha. 7 Ndi anātu ujọ, ndi dikwa egwu, ka ha bu: n'aka ha onwe-ha ka ikpé-ha na nbuli-elu-ha si aputa. 8 Inyinya-ha nile nwere ukwu nkọ kari agu, ha di kwa nkọ kari anu-ọhia wolf nke anyasi; ndi-inyinya-ha nāwuli kwa elu: e, ndi-inyinya-ha nēsi n'ebe di anya bia; ha nēfe dika ugo nke nēfe ngwa iri ihe. 9 Ha nile nābia ime ihe-ike; edosiri iru-ha ike dika ifufe Iru-anyanwu; ha we chikọta ndi adọtara n'agha dika ájá. 10 E, mba ahu nākwa ndi-eze emò, ndi-isi bu-kwa-ra ya ihe-ichì-ọchì: mba ahu nāchì ebe ọ bula ewusiri ike ọchì; n'ihi na o nēkpokọba ájá, we were ya. 11 Mb͕e ahu ọ gēfebiga dika ifufe, o we gabiga, ikpe ama ya: ike-ya nka ewe ghọ chi-ya. 12 Ọ̀ bughi Gi onwe-gi siteworo na mb͕e ochie, Jehova, bú Chinekem, Onye Nsọm? ayi agaghi-anwu. Jehova, ọ bu ikpe ikpe ka I doworo ya; Gi Oké Nkume, ọ bu kwa iba nba ka I tọworo ya ntọ-ala. 13 Gi onye anya-Gi abua di ọcha kari ihu ihe ọjọ, Onye nāpughi kwa ilegide nmeb͕u anya, n'ìhi gini ka I nēlegide ndi nāghọb͕u aghọb͕u? n'ìhi gini ka I nāb͕a nkiti mb͕e onye nēmebi iwu nēloda onye di ezi omume kari ya; 14 I we me madu ka ha di ka azù nke oké osimiri, dika ihe nākpu akpu, nke nēnweghi onye nāchi ha? 15 Ha nile ka o ji nkò-azù dọkpuru, o nēkpochapu ha n'eriri-ya, chikọta ha n'ub͕u-ya: n'ihi nka ka ọ nāṅuri, tegharia egwú ọṅù. 16 N'ihi nka ka ọ nāchuru eriri-ya àjà, nēsurere ub͕u-ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; n'ihi na site na ha ka òkè-ya nwere urù, ihe-oriri-ya ma-kwa-ra abuba. 17 Ọ̀ gēwere n'ihi nka nāwupu eriri-ya, ghara inwe ọmiko n'ib͕u mba di iche iche mb͕e dum?

Habakuk 2

1 N'elu ebe m'nēche ka m'gēguzo, guzo kwa onwem n'elu ebe ewusiri ike, m'gēche kwa ihu ihe Ọ gēkwu megidem, na ihe m'gāzaghachi bayere iba-nbam. 2 Jehova we zam, si, De ọhù ahu n'elu mbadamba-ihe di iche iche, tu ya akika, ka onye nāgu ya we b͕a ọsọ. 3 N'ihi na ọhù ahu nādiru mb͕e akara àkà, ọ nēkusi-kwa-ra ọgwugwu-ya ume ike, ọ gaghi-ekwu kwa okwu-ugha: ọ buru na ọ la azu, chere ya; n'ihi na ọ ghaghi ibia, ọ gaghi-anọ ọdù. 4 Le, nkpuru-obi-ya afuliwo onwe-ya, o zighi ezi nime ya: ma onye ezi omume gēji okwukwe-ya di ndu. 5 E, ọzọ kwa, n'ihi na manya-vine-ya bu ihe-nghọb͕u, nwoke di nganga ka ọ bu nke nādighi-anọ kwa n'ulo; onye meworo ka ọchichọ-nkpuru-obi-ya sa mbara dika ala-mọ, ya onwe-ya di kwa ka ọnwu, afọ adighi-eju kwa ya, o we me ka mba nile zukọta n'ebe ọ nọ, ọ nāchikọta kwa ndi nile di iche iche n'ebe ọ nọ. 6 Ndia, hà nile agaghi-atu ilu megide ya, na okwu miri emi, ọbuná okwu omimi di iche iche, bayere ya, si, Ahuhu diri onye ahu nke nēme ka ihe nābughi nke ya ba uba! rùe ole mb͕e? onye ji ihe-ibe ebob͕u onwe-ya! 7 Ọ̀ bughi n'otù ntabi-anya ka ha gēbili, bú ndi nāta gi aru, ka ha gēteta, bú ndi nēme ka i ma jijiji, i gāghọ-kwa-ra ha ihe-npunara? 8 N'ihi na i kwatawo ọtutu mba, ya ka ndi nile fọduru nime ndi nile di iche iche gākwata gi; n'ihi ọbara madu na ihe-ike emere ala, nke emere obodo na ndi nile bi nime ya. 9 Ahuhu diri onye nēritara ulo-ya urù ọjọ, ido akwu-ya n'elu, ka ewe naputa ya n'ọbu-aka ihe ọjọ! 10 I duworo ulo-gi ọdu ihere, ibipu ọtutu ndi di iche iche, i we nēmehie megide nkpuru-obi-gi. 11 N'ihi na nkume gēsi na mb͕idi tie nkpu, ntuhie gēsi kwa n'osisi di n'ulo za ya. 12 Ahuhu diri onye ji ọbara ewu obodo, onye ji kwa ajọ omume me ka obodo guzosie ike! 13 Le, ò siteghi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha na ndi di iche iche nādọb͕u onwe-ha n'ọlu nye ọku, na ike nāgwu kwa mba nile n'efu? 14 N'ihi na uwa gējuputa n'ọmuma ebube Jehova, dika miri si ekpuchi oké osimiri. 15 Ahuhu diri onye nēme ka madu-ibe-ya ṅua ihe, onye nāgwakọta ya na ọnuma-gi, ọzọ, i nēme kwa ka ọ ṅubiga manya ókè, ka i we legide ọtọ-ha anya! 16 Afọ ihere ejuwo i kari nsọpuru: ṅua, ọbuná gi onwe-gi, ghọ onye anēbìghi úgwù: iko aka-nri Jehova gēchighari rue gi aru, ihere nke jọb͕uru onwe-ya gādi kwa n'elu ebube-gi. 17 N'ihi na ihe-ike emere Lebanon gēkpuchi gi, na nbibi nke anumanu di iche iche, nke mere ka ha tua ujọ; n'ihi ọbara madu na ihe-ike emere ala, nke emere obodo na ndi nile bi nime ya. 18 Ùrù gini ka arusi apiri api bara, na onye nēme ya apiwo ya? ùrù gini ka arusi awuru awu na onye-ozízí okwu-ugha bara, na onye nākpu ihe-ya akpuru akpu atukwasiwo ya obi, ime arusi dara ob͕i di iche iche? 19 Ahuhu diri onye nāsi osisi, Teta; nke nāsi nkume dara ob͕i, Kpọte onwe-gi! Nka, ò gēzí ihe? Le, ihe a bu ihe eji ọla-edo na ọla-ọcha machita, ọ dighi kwa mọ ọ bula di nime ya. 20 Ma Jehova nọ n'ulo uku Ya di nsọ: dere du n'iru Ya, gi uwa nile.

Habakuk 3

1 Ekpere nke Habakuk, bú onye-amuma, n'elu Shigionoth. 2 Jehova, anuwom ihe anuru bayere Gi, m'tua egwu: Jehova, tute ọlu-Gi n'etiti arọ nile, N'etiti arọ̀ nile ka I gēme ka amara ya; N'oké iwe cheta obi-ebere. 3 Chineke si na Timan nābia, Onye Nsọ si kwa n'ugwu Peran. SelahEbube-Ya ekpuchiwo elu-igwe nile, Otuto-Ya juputa-kwa-ra uwa. 4 Onwunwu-Ya di ka ìhè; Ìhè nēnwuputa n'aka-Ya: Ọ bu kwa n'ebe ahu ka ebe-nzuzo nke ike-Ya di. 5 N'iru Ya ka ajọ ọria nke nēfe efe nāga, Anwuru-ọku si kwa n'ukwu-Ya abua nāputa. 6 O guzoro, we tùa uwa; O lere anya, we me ka mba nile kuja: Ewe tipia ugwu nile di mb͕e ebighi-ebi, Ugwu ntà ebighi-ebi nile ruru ala; Ojije nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga bu nke Ya. 7 N'okpuru ajọ ihe ka m'huworo ulo-ikwū nile nke Kushan: Ákwà-nkwuba nile nke ala Midian nāma jijiji. 8 Ọ̀ bu osimiri ka Jehova were oké iwe megide? Ọ̀ bu osimiri ka iwe-Gi nēmegide? Ma ọ̀ bu oké osimiri ka nrubiga-ókè nke iwe-Gi nēmegide? Na I nānọkwasi n'inyinya-Gi nile, N'ub͕ọ-ala-Gi nile nke bu nzọputa. 9 Ab͕abasiri uta-Gi ọtọ; Iyi nile aṅuru ebo-Gi nile bu okwu-ọnu kwesiri ntukwasi-obi. SelahI nēji osimiri b͕awa ala. 10 Ugwu nile huru Gi, we nāb͕ali; Okè miri-ozuzo gabigara: Ob͕u-miri mere ka olu-ya da, Chilie aka-ya elu. 11 Anyanwu na ọnwa guzoro n'ebe-obibi-ha; N'ìhè àkú-Gi nile mb͕e ha nāga, N'onwunwu nke ube-Gi nēb͕upu àmùmà. 12 N'oké iwe ka I nāzọ ije n'ala, N'iwe ka I nāzọcha mba di iche iche dika ọka. 13 I putawo ìhè izọputa ndi-Gi, Izọputa onye-Gi etere manu; I mabipuwo isi n'ulo ndi nēmebi iwu, B͕aba ntọ-ala-ya ọtọ rue olu. Selah 14 I jiwo nkpa-n'aka-ya dupue ndi-agha-ya isi: Bú ndi nābia dika oké ifufe ifesam: Obi-utọ-ha di ka agāsi na ha gaje iripia onye ewedara n'ala n'ebe-nzuzo. 15 I chiriwo inyinya-Gi zọ ije n'oké osimiri, Bú obo nke ọtutu miri. 16 Anurum, afọm we ma jijiji, N'olu ahu eb͕ub͕ere-ọnum abua nākukọta; Ire-ure nābà n'ọkpukpum nile, ọ bu kwa n'ọnọdum ka m'nāma jijiji: Ka m'we zue ike rue ubọchi ahuhu, Mb͕e ọ nārigota imegide ndi ahu nke nēmegide ya n'usu ndi nāpunara madu ihe. 17 Asi na osisi fig adighi-ama ifuru, Na ọ dighi ihe-ọmume di n'osisi vine; Na ihe aluputara n'osisi olive ebilatawo, Na ubi nile emeghi ihe-oriri; Na ebipuwo ìgwè ewu na aturu n'ogige ewu na aturu, Na ọ dighi ìgwè ehi di n'ulo ehi: 18 Ma mu onwem gāṅuri ọṅu nime Jehova, M'gēteghari egwú ọṅù nime Chineke nke nzọputam. 19 Jehova, bú Onye-nwe-ayi, bu ikem, Ọ nēme kwa ukwum abua ka ha di ka ukwu ele, Ọ bu kwa n'ebem nile di elu ka Ọ gēme ka M'zọ ije. Ọ diri Onye-isi Abù, n'ubọ-akwaram nile.

Zefanaia 1

1 Okwu Jehova nke ruru Zefanaia nwa Kushi, nwa Gedalaia, nwa Amaraia, nwa Hezekaia, nti, n'ubọchi Josaia nwa Emon, bú eze Juda. 2 M'gēkpochapusi ihe nile n'elu uwa; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 3 M'gēkpochapu madu na anumanu; M'gēkpochapu anu-ufe nke elu-igwe, na azù nke oké osimiri, na ihe-isu-ngọngọ nile, ha na ndi nēmebi iwu; M'gēbipu kwa madu n'elu uwa; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 4 M'gēseti kwa akam imegide Juda, na imegide ndi nile bi na Jerusalem; M'gēbipu kwa ndi Beal fọduru n'ebe a, na aha ndi-nchu-àjà arusi, ha na ndi-nchu-àjà nile; 5 na ndi nākpọ isi ala nye usu ihe nile di n'elu-igwe n'elu-ulo nile; na ndi nākpọ isi ala, ndi nāṅuru Jehova iyi, ndi ji kwa Malkam aṅu iyi; 6 na ndi si n'iso Jehova laghachi azu; na ndi nāchọghi Jehova, nājughi kwa ase Ya. 7 Dere du n'iru Onye-nwe-ayi Jehova: n'ihi na ubọchi Jehova di nso: n'ihi na Jehova edoziwo àjà, O dowo ndi Ọ kpọrọ oriri nsọ. 8 Ọ gēru kwa, n'ubọchi àjà Jehova, na M'gēji nmehie ndi-isi, ji kwa nmehie umu eze, ji kwa nmehie ndi nile nēyi uwe ala ọzọ, leta ha. 9 M'gēji kwa nmehie onye ọ bula nke nāmabiga nbata-uzọ leta ya n'ubọchi ahu, bú ndi nēmeju ulo ndi-nwe-ha n'ihe-ike na aghughọ. 10 Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na olu iti-nkpu gēsi n'ọnu-uzọ-ama azù da, ya na ikwasi-ákwá-ike site n'obodo nke-abua, na oké ntiwa site n'ugwu ntà nile. 11 Kwasienu ákwá ike, unu ndi bi na Maktesh, n'ihi na ndi Kenean nile alawo n'iyì: ebipuwo ndi nile eboro ọla-ọcha. 12 Ọ gēru kwa, na mb͕e ahu, na M'gāchiri oriọna chọsie ike nime Jerusalem; M'gēji kwa nmehie ndikom ahu ndi raruru araru n'idi ka manya-vine doro edo leta ha, ndi nāsi n'obi-ha, Jehova agaghi-eme ezi ihe, Ọ gaghi-eme kwa ihe ọjọ. 13 Àkù-ha gāghọ kwa ihe apunaraworo ha, ulo nile ha gāghọ kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu: e, ha gēwu ulo, ma ha agaghi-ebi nime ha; ha gāku kwa ubi-vine, ma ha agaghi-aṅu manya-vine-ha. 14 Oké ubọchi Jehova di nso, ọ di nso, ọ nēme kwa ngwa nke-uku: ge nti olu ubọchi Jehova; dike nēti nkpu di ilu n'ebe ahu. 15 Ubọchi nrubiga-ókè nke iwe ka ubọchi ahu bu, ubọchi ahuhu na nkpab͕u, ubọchi nke ime nkpọnkpọ-ebe na itọb͕ọrọ n'efu, ubọchi ọchichiri na oké nb͕achi, ubọchi igwe-oji na oké ọchichiri, 16 ubọchi opì-ike na iti-nkpu agha, imegide obodo nile ewusiri ike, na imegide ulo-nkuku nile di elu. 17 M'gēme kwa ka nkpà kpa madu, ha ewe jegharia dika ndi-ìsì, n'ihi na ọ bu Jehova ka ha mehieworo megide: agāwusi kwa ọbara-ha dika ájá, wusi kwa anu-aru-ha dika ǹsí. 18 Ọla-ọcha-ha ma-ọbu ọla-edo-ha agaghi-enwe ike inaputa ha anaputa n'ubọchi nrubiga-ókè nke iwe Jehova; ma agēji ọku nke ekworo-Ya ripia ala-ha nile: n'ihi na ngwusi, nke bu nání obi-ọlulọ-miri, ka Ọ gēme ka ndi nile bi n'ala nka gwusia.

Zefanaia 2

1 Chikọtanu onwe-unu, e, chikọta dika ahihia-ọka, unu mba nke nēnweghi ihere; 2 tutu ukpuru amuputa nwa, (ubọchi agabigawo dika ib͕ob͕o-ọka), mb͕e ọnuma nke iwe Jehova akābiakwasighi unu, mb͕e ubọchi iwe Jehova akābiakwasighi unu. 3 Chọnu Jehova, unu nile ndi di ume-ala n'obi bi n'uwa, ndi luworo ihe O kpere n'ikpe; chọnu ezi omume, chọnu ume-ala-n'obi: eleghi anya agēzobe unu n'ubọchi iwe Jehova. 4 N'ihi na Geza gābu ebe arapuru arapu, Ashkelon gāghọ kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu: Ashdod, n'etiti-ehihie ka agāchupu ya, agēropu kwa Ekron. 5 Ahuhu diri ndi bi n'akuku oké osimiri, bú mba ndi Keret! Okwu Jehova nēmegide unu, Kenean, ala ndi Filistia; M'gēme kwa ka i la n'iyì ghara inwe onye-obibi. 6 Akuku oké osimiri gābu kwa ebe-obibi ebe-obibi, bú ulo ntà nke ndi-ọzùzù-aturu na ogige ìgwè ewu na aturu. 7 Akuku oké osimiri gābu-kwa-ra ndi ulo Juda fọduru; n'elu ha ka ha gāzù igwè ewu na aturu-ha: n'ulo nile nke Ashkelon ka ha gāmakpu amakpu n'anyasi; n'ihi na Jehova, bú Chineke-ha, gēleta ha, me ka ndi-ha adọtara n'agha lata. 8 Anuwom ita-uta Moab, na nkwulu nile nke umu Amon, nke ha jiworo ta ndim uta, me onwe-ha uku megide ókè-ala-ha. 9 N'ihi nka, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, puta), n'ezie Moab gādi ka Sọdọm, umu Amon gādi kwa ka Gọmọra, ihe-onwunwe nke akuba, na olùlù-nnú, na ebe tọb͕ọrọ n'efu rue mb͕e ebighi-ebi: ndim fọduru gāluta ihe-ha n'agha, ndi mbam fọduru gēketa kwa ha. 10 Nka ka ha gēnwe n'ihi npako-ha, n'ihi na ha atawo ndi Jehova nke usu nile nke ndi-agha uta, me onwe-ha uku imegide ha. 11 Onye di egwu ka Jehova gābu n'imegide ha: n'ihi na Ọ gēme ka chi nile nke uwa ta aru; madu gākpọ kwa isi ala nye Ya, onye ọ bula site n'ọnọdu-ya, bú agwe-etiti nile nke mba nile. 12 Unu onwe-unu kwa, bú ndi Etiopia, ndi mma-agham b͕uru eb͕u ka ha bu. 13 Ọ gēseti kwa aka-Ya imegide Ugwu, me ka Asiria la n'iyì; Ọ gēme kwa ka Nineve ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ala kpọrọ nku dika ọzara. 14 Ìgwè anumanu di iche iche gāmakpu amakpu n'etiti ya, anu-ọhia nile nke mba nile: ma okwolo ma ebinta gānọ ọnọdu-abali n'isi-ogidi-ya nile: ge nti olu-ha nābù abù nime window; ime-nkpọtu na nbata-uzọ: n'ihi na ebe eji osisi cedar wu ka Ọ b͕abaworo ọtọ. 15 Nka bu obodo ahu nke nāṅuri ọṅu-agha, nke nānọ na ntukwasi-obi, nke nāsi n'obi-ya, Mu onwem nọ, ọ dighi kwa otù efu ọzọ di ma ewezuga nání mu onwem: le otú ọ ghọworo ebe tọb͕ọrọ n'efu, ebe-nmakpu diri anu-ọhia! onye ọ bula nke nāgabiga n'akuku ya gāma ọsọ, fegharia aka-ya.

Zefanaia 3

1 Ahuhu diri obodo nke nēnupu isi, nke ruwo-kwa-ra árú, obodo ahu nke nēme ihe-ike! 2 Ọ geghi nti olu Chineke; ọ naraghi idọ-aka-na-nti; Jehova ka ọ nātukwasighi obi; Chineke-ya ka ọ nābiakuteghi nso. 3 Ndi-isi-ya n'etiti ya bu ọdum nāb͕ọ uja; ndi-ikpe-ya bu anu-ọhia wolf nke anyasi; ha ekpechaghi ọkpukpu n'ututu. 4 Ndi-amuma-ya bu ndi obi-ha nādighi n'otù ebe, ndi-nghọb͕u: ndi-nchu-àjà-ya emewo ka ihe nsọ ghara idi nsọ, ha emewo iwu ihe-ike. 5 Jehova bu onye ezi omume n'etiti ya; Ọ dighi-eme ajọ omume; kwa-ututu ka Ọ nēme ka ikpé-Ya puta ìhè, ọ dighi mb͕e Ọ nādighi; ma onye ajọ omume adighi-ama ihere. 6 Ebipuwom mba di iche iche, ulo-nkuku nile ha tọb͕ọrọ n'efu; emewom ka èzí nile ha buru nkpọnkpọ-ebe, onye-ngabiga we ghara idi: emebisiwo obodo nile ha, onye ọ bula we ghara idi, ha we ghara inwe onye-obibi. 7 Asirim, N'ezie i gātu egwum, i gānara idọ-aka-na-nti; ewe ghara ibipu ebe-obibi-ya, dika ihe nile si di nke M'jiworo leta ya: ma otú ọ di, ha biliri n'isi-ututu, bibie omume nile ha. 8 N'ihi nka cherenum, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), cherenu ubọchi mb͕e M'gēbili ọtọ ikwata ihe: n'ihi na ikpém bu ime ka mba nile zukọta, ka M'we chikọta ala-eze nile, iwusa ha oké iwem, bú ọnuma nile nke iwem; n'ihi na agēji ọku nke ekworom ripia uwa nka nile. 9 N'ihi na mb͕e ahu ka M'gāb͕anwere ndi nile di iche iche eb͕ub͕ere-ọnu di ọcha, ka ha nile we kpọkue aha Jehova, ifè Ya n'otù ùbú. 10 Site n'ofè osimiri nile nke Etiopia ka ndi-aririọm, bú ada ndim achusara achusa, gēburu onyinye-inata-iru-ọmam. 11 N'ubọchi ahu ka ihere omume-gi nile nāgaghi-eme gi, bú nke i jiworo jehie megidem: n'ihi na mb͕e ahu ka M'gēwezuga n'etiti gi ndi-gi nāṅuri ọṅu-agha nime npakọ, i gaghi-adi kwa npako ọzọ n'ugwu nsọm. 12 M'gēme kwa ka otù ndi ewedara n'ala nke nēnweghi kwa ike fọdu n'etiti gi, ha gāb͕abà kwa n'aha Jehova. 13 Ndi Israel fọduru agaghi-eme ajọ omume, ha agaghi-ekwu kwa okwu-agha; agaghi-ahu kwa ire aghughọ n'ọnu-ha: n'ihi na ndi ahu gāzù onwe-ha makpu kwa amakpu dika aturu, ọ dighi kwa onye ganēme ka ha ma jijiji. 14 Tie nkpu ọṅù, gi ada Zaion; tie nkpu, gi Israel; ṅuria, were obi nile ṅuria ọṅu-agha, gi ada Jerusalem. 15 Jehova ewezugawo ikpé-gi nile, Ọ chughachiwo onye-iro-gi: Eze Israel, bú Jehova, nọ n'etiti gi: i gaghi-atu egwu ihe ọjọ ọzọ. 16 N'ubọchi ahu ka agāsi Jerusalem, Atula egwu: gi Zaion, ekwela ka aka-gi abua kuda. 17 Jehova, bú Chineke-gi, nọ n'etiti gi, Ọ bu dike nke nāzọputa: O gēji ọṅù nwe obi-utọ n'aru gi, Ọ gedere du n'ihu-n'anya-Ya, Ọ gēji iti-nkpu-ọṅù teghari egwu ọṅù n'aru gi. 18 Ndi ọ nēwuta n'ihi mb͕e akara àkà ka M'gēme ka ha zukọta, bú ndi sitere na gi: bú obodo nke ibu eboro ya bu ita-uta. 19 Le, M'ganēmeso ndi ahu nile, bú ndi nēweda gi n'ala, na mb͕e ahu: M'gāzọputa kwa nwanyi ahu nke nēje nsukwara-achi, ọ bu kwa nwanyi nke achupuru achupu ka M'gāchikọta; M'gēme kwa ka ha ghọ otuto, ghọ kwa aha, bú ndi ihere-ha di n'uwa nka nile. 20 Na mb͕e ahu ka M'gēme ka unu bata, ọ bu kwa na mb͕e ahu ka M'gāchikọta unu: n'ihi na M'gēme ka unu ghọ aha, ghọ kwa otuto n'etiti ndi nile di iche iche nke uwa, mb͕e M'gēme ka ndi-unu adọtara n'agha lata n'anya-unu, ka Jehova siri.

Hagai 1

1 N'arọ nke-abua nke Daraiọs, bú eze, n'ọnwa nke-isi, n'ubọchi mbu n'ọnwa, ka okwu Jehova si n'aka Hagai, bú onye-amuma, rue Zerubabel nwa Shealtiel, bú onye nāchi ala Juda, ru kwa Joshua nwa Jehozadak, bú onye-isi-nchu-àjà, nti, si, 2 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha kwuru, si, Ndi nka siri, Oge ibia erughi, bú oge iwu ulo Jehova. 3 Okwu Jehova we si n'aka Hagai, bú onye-amuma, bia, si, 4 Ọ̀ bu oge unu nwere, unu onwe-unu, ibi n'ulo-unu amachitara osisi, mb͕e ulo a bu nkpọnkpọ ebe? 5 Ma ub͕u a, otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Tukwasinu obi-unu n'uzọ nile unu. 6 Unu aghawo ọtutu nkpuru, ma nke-ntà ka unu webatara; unu nēri ihe, ma ọ dighi afọ juworo unu; unu nāṅu ihe-ọṅuṅu, ma ọ dighi nṅuju-afọ unu ṅujuworo; unu yiri uwe, ma ọ dighi okpom-ọku nēkpo madu; ọzọ, onye nāluta ugwọ-ọlu nāluta ugwọ-ọlu itiye n'akpa puru epu. 7 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Tukwasinu obi-unu n'uzọ nile unu. 8 Rigonu n'ugwu, bute osisi, wue ulo a, ọ gātọkwam utọ, agāsọpu-kwa-ram, ka Jehova siri. 9 Unu lere anya ihe bara uba, ma, le, ọ ghọrọ ihe ntà; mb͕e unu bulatara ya ulo, M'we fùsasia ya, N'ìhi gini? (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta). N'ihi ulom, nke bu nkpọnkpọ ebe; ma unu onwe-unu nāb͕a ọsọ, onye ọ bula ọ b͕akuru ulo nke aka ya. 10 N'ihi nka ka elu-igwe nke di n'elu unu b͕ochiworo igirigi, ala eb͕ochiwo kwa ihe-omume-ya. 11 M'we kpọ oge ọkpukpọ-nku ka ọ dakwasi ala nka na ugwu-ya nile na ọka-ya na manya-vine ọhu ya na manu ọhu ya na ihe nile nke ala nēpuputa na madu na anumanu na ihe nile unu dọb͕uru onwe-unu n'ọlu inweta. 12 Zerubabel nwa Shealtiel, na Joshua nwa Jehozadak, bú onye-isi-nchu-àjà, na ndi Israel nile fọduru, we ge nti olu Jehova, bú Chineke-ha, ge kwa nti okwu nile nke Hagai, bú onye-amuma, dika Jehova, bú Chineke-ha, zitere ya; ndi Israel we tua egwu n'iru Jehova. 13 Hagai, bú onye-ozi Jehova, we gwa ndi Israel okwu n'ozi Jehova, si, Mu onwem nọyere unu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 14 Jehova we kpọte mọ Zerubabel nwa Shealtiel, bú onye nāchi ala Juda, na mọ Joshua nwa Jehozadak, bú onye-isi-nchu-àjà, na mọ nke ndi Israel nile fọduru; ha we bia je ozi n'ulo Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke-ha, 15 n'ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa ahu, n'ọnwa nke-isi, n'arọ nke-abua nke Daraiọs, bú eze.

Hagai 2

1 N'ọnwa nke-asa, n'ubọchi nke-orú-na-otù nke ọnwa ahu, okwu Jehova we si n'aka Hagai, bú onye-amuma, bia, si, 2 Biko, gwa Zerubabel nwa Shealtiel okwu, bú onye nāchi ala Juda, gwa kwa Joshua nwa Jehozadak, bú onye-isi-nchu-àjà, gwa kwa ndi Israel fọduru, si, 3 Ònye fọduru n'etiti unu nke huru ulo a n'ebube mbu ya? ọ̀ di kwa aṅa n'anya-unu onwe-unu ub͕u a? ọ̀ dighi nání ka ihe-efu n'anya-unu? 4 Ma ub͕u a, di ike, Zerubabel, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); di ike, Joshua, nwa Jehozadak, bú onye-isi-nchu-àjà; di ike, unu ndi nile nke ala nka, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), luanu ọlu: n'ihi na Mu onwem nọyere unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), 5 dika okwu ahu si di nke Mu na unu b͕ara n'ọb͕ub͕a-ndu-mb͕e unu siri n'Ijipt puta, Mọm nēguzo kwa n'etiti unu: unu atula egwu. 6 N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ọ fọduru otù ub͕ò, nwa mb͕e ntà ka ọ bu, Mu onwem gaje ime ka elu-igwe na uwa na oké osimiri na ala kpọrọ nku me nkpatu; 7 M'gēme kwa ka mba nile me nkpatu, ihe anāchọsi ike nke mba nile gābia kwa, M'gēmeju kwa ulo a n'ebube, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri. 8 Mu nwe ọla-ọcha nile, ọ bu kwa Mu nwe ọla-edo nile; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 9 Ebube ikpe-azu nke ulo a gādi uku kari ebube mbu, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: ọ bu kwa n'ebe a ka M'gēnye udo; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta. 10 N'ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa nke-iteghete, n'arọ nke-abua nke Daraiọs, okwu Jehova we si n'aka Hagai bú onye-amuma, bia, si 11 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Biko, jua ndi-nchu-àjà ajuju iwu, si, 12 Le, ọ buru na onye ọ bula eburu anu nsọ n'ọnu-ọnu-ala nke uwe-ya, were kwa ọnu-ọnu-ala nke uwe-ya metu achicha, ma-ọbu ofé, ma-ọbu manya-vine, ma-ọbu manu, ma-ọbu ihe-oriri ọ bula, ọ̀ gādi nsọ? Ndi-nchu-àjà we za, si, É-è. 13 Hagai we si, Ọ buru na onye ruru árú site na madu nwuru anwu emetu ihe ọ bula n'ihe ndia, ọ̀ gāru árú? Ndi-nchu-àjà we za, si, Ọ gāru árú. 14 Hagai we za, si, Otú a ka ndi nka di, ọ bu kwa otú a ka mba nka di n'irum; (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); ọ bu kwa otú a ka ọlu ọ bula nke aka-ha di; ọzọ, ihe ha nēweta nso n'ebe ahu, ihe ruru árú ka ọ bu. 15 Ma ub͕u a, biko, tukwasinu obi-unu na mb͕e a site n'ubọchi ta laghachi azu, site na mb͕e akātukwasighi nkume n'elu nkume n'ulo uku Jehova: 16 na mb͕e ahu nile, mb͕e madu biara n'obo-ihe di orú ọtùtù, ha di nání iri; mb͕e madu biara n'ebe-inara-manya-vine ikupu ọgu ite abua na iri, nání orú di. 17 Ejirim nchakpọ, ji kwa ọmuma-ebù, ji kwa ákú-miri-ígwé, tib͕ue unu n'ọlu nile nke aka-unu; ma ọ dighi nchighari unu chigharikuterem; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 18 Biko, tukwasinu obi-unu na mb͕e a, site n'ubọchi ta laghachi azu, site n'ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa nke-iteghete, site n'ubọchi ahu mb͕e atọrọ ntọ-ala ulo uku Jehova, tukwasinu obi-unu na ya. 19 Nkpuru-ọghigha, ọ̀ di n'ọba rue ub͕u a? ọzọ kwa, osisi vine na osisi fig na osisi pomegranate na osisi olive amighi nkpuru; site n'ubọchi ta ka M'ganāgọzi unu. 20 Okwu Jehova we rue Hagai nti nke ub͕ò abua n'ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa ahu, si, 21 Gwa Zerubabel, bú onye nāchi ala Juda, okwu, si, Mu onwem gaje ime ka elu-igwe na uwa me nkpatu: 22 M'gākwatu kwa oche-eze nke ala-eze nile, M'gēkpochapu kwa ike nke ala-eze nile nke mba nile; M'gākwatu kwa ub͕ọ-ala, na ndi nānọkwasi ha; inyinya na ndi nānọkwasi ha gārida kwa, onye ọ bula site na mma-agha nwa-nne-ya. 23 N'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), ka M'gēwere gi, Zerubabel nwa Shealtiel, bú orùm, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), me gi ka i di ka nb͕a-aka-akàrà: n'ihi na gi ka M'rọputaworo; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta.

Zekaraia 1

1 N'ọnwa nke-asatọ, n'arọ nke-abua nke Daraiọs, ka okwu Jehova ruru Zekaraia nwa Berekaia, nwa Ido, bú onye-amuma, nti, si, 2 Jehova ewesawo nna-unu-hà oké iwe. 3 I gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Laghachikutenum, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), M'gālaghachikute kwa unu, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri. 4 Unu adila ka nna-unu-hà, ndi ndi-amuma mbu kpọrọ òkù, si, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Biko, sinu n'uzọ ọjọ nile unu, na n'omume ọjọ nile unu, lata: ma ha anughi, ha aṅaghkwam nti; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 5 Nna-unu-hà, òle ebe ha nọ? ndi-amuma kwa, ọ̀ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka ha nādi ndu? 6 Ma otú ọ di, okwum nile na ukpurum nile nke M'nyere ndi-orùm, bú ndi-amuma, n'iwu, hà erughi nna-unu-hà aru? ha we chigharia, si, Dika Jehova nke usu nile nke ndi-agha zubere ime ayi, dika uzọ nile ayi si di, na dika omume nile ayi si di, otú a ka O mesoworo ayi. 7 N'ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa nke-iri-na-otù, nke ahu bu ọnwa Shebat, n'arọ nke-abua nke Daraiọs, okwu Jehova we rue Zekaraia nwa Berekaia, nwa Ido, bú onye-amuma, nti, si, 8 Ahurum n'abali, ma, le otù onye nke nānọkwasi inyinya nācha uhie uhie, onye ahu nēguzo kwa n'etiti osisi myrtle nke di n'ebe miri emi; n'azu ya ka inyinya di iche iche guzoro, nke nācha uhie uhie, na nke nācha dika manu, na nke nācha ọcha. 9 M'we si, Ǹdia bu gini, onye-nwem? Mọ-ozi ahu nke nāgwam okwu sirim, Mu onwem gēme ka i hu ihe ndia bu. 10 Onye ahu nke nēguzo n'etiti osisi myrtle we za, si, Ndia bu ndi Jehova ziteworo ijeghari n'uwa. 11 Ha we za mọ-ozi nke Jehova nke nēguzo n'etiti osisi myrtle, si, Ayi ejeghariwo n'uwa, ma, le, uwa nka nile nànọdu du, di jū. 12 Mọ-ozi nke Jehova we za, si, Jehova nke usu nile ndi-agha, rùe ole mb͕e ka Gi onwe-gi nāgaghi-emere Jerusalem na obodo Juda nile ebere, bú nke I wesaworo oké iwe ọgu arọ atọ na iri ndia? 13 Jehova we za mọ-ozi nke nāgwam okwu okwu ọma di iche iche, bú okwu nkasi-obi. 14 Mọ-ozi nke nāgwam okwu we sim, Kpọsa, si, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ekwoworom Jerusalem na Zaion oké ekworo. 15 Ọ bu kwa iwe uku ka Mu onwem nēwesa mba nile ndi nọ jū: n'ihi na Mu onwem were iwe nke-ntà, ma ha onwe-ha yere aka ime ha ihe ọjọ. 16 N'ihi nka ka Jehova siri otú a: Ejiwom obi-ebere nile laghachikute Jerusalem; agēwu ulom nime ya, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), agēseti kwa eriri-ọtùtù n'elu Jerusalem. 17 Kpọsa ọzọ, si, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Obodom nile gēsite n'ezi ihe b͕asa ọzọ; Jehova gākasi kwa Zaion obi ọzọ, rọputa Jerusalem ọzọ. 18 M'we welie anyam abua, hu, ma le, mpi anọ. 19 M'we si mọ-ozi nke nāgwam okwu, Ìhe ndia bu gini? Ọ we zam, Ndia bu mpi ahu nke sọsaworo Juda na Israel na Jerusalem. 20 Jehova we me ka m'hu ndi-ọ̀kà anọ. 21 M'we si, Gini ka ndia nābia ime? O kwue, si, Ndia bu mpi ndi sọsara Juda, onye ọ bula we ghara iweli isi-ya: ma ndia abiawo ime ka ha ma jijiji, ituda mpi nile nke mba nile, ndi buliri mpi-ha imegide ala Juda isọsa ya.

Zekaraia 2

1 M'we welie anyam, hu, ma le, otù onye nke eriri-ọtùtù di n'aka-ya. 2 M'we si, Òle ebe gi onwe-gi nēje? Ọ sim, Itù Jerusalem, ihu ka obosara-ya ra, na ka ogologo-ya ra. 3 Ma, le, mọ-ozi nke nagwām okwu nāpu, mọ-ozi ozọ nāpu kwa izute ya, 4 si ya, B͕a ọsọ, gwa nwa-okorọbia nka okwu, si, N'obodo di iche iche nēnweghi mb͕idi ka Jerusalem gēbi, site n'iba-uba madu na anumanu di nime ya. 5 N'ihi na Mu onwem gāburu ya mb͕idi ọku buruburu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ọ bu kwa ebube ka M'gāghọ n'etiti ya. 6 Éwù, éwù, sinu n'ala Ugwu b͕alaga, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): n'ihi na dika ifufe anọ nke elu-igwe ka M'chusaworo unu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 7 Éwù, gi Zaion, wepuga onwe-gi, gi nwanyi nke gi na ada Babilon nēbi. 8 N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ọ bu mb͕e nsọpuru gasiri ka O ziworom jekuru mba nile ndi nākwata unu: n'ihi na onye nēmetu unu aka nēmetu nwa-anya-Ya. 9 N'ihi na, le, M'gaje ifeghari akam n'aru ha, ha gābu-kwa-ra ndi nēfè ha ihe-nkwata: unu ewe mara na Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezitewom. 10 Tie nkpu ọṅù, ṅuria, gi ada Zaion: n'ihi na, le, Mu nābia, M'gēbi kwa n'etiti gi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 11 Ọtutu mba gārapa-kwa-ra na Jehova n'ubọchi ahu, ghọ-kwa-ram otù ndi: M'gēbi kwa n'etiti gi, i we mara na Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezìwom biakute gi. 12 Jehova gēketa kwa Juda n'òkè-Ya n'elu ala nsọ a, rọputa kwa Jerusalem ọzọ. 13 Dere du, unu anu-aru nile, n'iru Jehova: n'ihi na O siwo n'ebe-obibi-Ya di nsọ teta.

Zekaraia 3

1 Ọ we me ka m'hu Joshua, bú onye-isi-nchu-àjà, ka ọ nēguzo n'iru mọ-ozi nke Jehova, na Setan, ka o nēguzo n'aka-nri-ya imegide ya. 2 Jehova we si Setan, Jehova basiere gi nba ike, Setan; e, Jehova Nke rọputaworo Jerusalem basiere gi nba ike: onye a, ọ̀ bughi ọlọkọ-ọku alọputara n'ọku? 3 Ma Joshua nēyi uwe rusiri inyi, guzo n'iru mọ-ozi ahu. 4 O we za, gwa ndi nēguzo n'iru ya okwu, si, Chizuga uwe rusiri inyi n'aru ya. O we si ya, Le, emewom ka ajọ omume-gi si n'aru gi gabiga, M'gēyibe kwa gi uwe ememe. 5 M'we si, Ka ha kukùa ákwà-nkukù-isi nwuru enwu n'isi-ya. Ha we kee akwa nkechi-isi nwuru enwu n'isi-ya, yibe ya uwe; mọ-ozi Jehova nēguzo kwa n'ebe ahu. 6 Mọ-ozi nke Jehova we b͕ara Joshua àmà nke-uku, si, 7 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ọ buru na i je ije n'uzọm nile, ọ buru kwa na i debe ihe-ndebem, ọ gābu kwa na gi onwe-gi gēkpe ulom ikpe, ọzọ, i gēdebe kwa ogigem nile, M'gēnye kwa gi ebe-njeghari di iche iche n'etiti ndia nēguzo n'ebe a. 8 Biko, nuru, gi Joshua, bú onye-isi-nchu-àjà, gi onwe-gi na ndi-ibe-gi ndi nānọdu ala n'iru gi; n'ihi na ndi bu ihe-ebube ka ha bu: n'ihi na, le, M'gaje ime ka orùm, bú Ihe-opupú ahu, puta ìhè. 9 N'ihi na, le, nkume ahu nke M'tiyeworo n'iru Joshua; n'elu otù nkume ka anya asa di: le, M'gēb͕u eb͕ub͕u-ya, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gēbupu kwa ajọ omume ala ahu n'otù ubọchi. 10 N'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), ka unu gākpọbata, onye ọ bula ọ kpọbata madu-ibe-ya, n'okpuru osisi vine na n'okpuru osisi fig.

Zekaraia 4

1 Mọ-ozi ahu nke nāgwam okwu we biaghachi, kpọtem, dika onye anākpọte n'ura-ya. 2 O we sim, Gini ka gi onwe-gi nāhu? M'we si, Ahuwom, ma, le, ihe-idọba-oriọna, nke bu nání ọla-edo ọla-edo, ya na ọkwa-ya n'isi-ya, na oriọna asa n'elu ya: ihe asa eji ab͕aye manu diri oriọna nile n'otù n'otù, bú nke di n'isi-ya: 3 osisi olive abua di kwa n'akuku ya, otù n'aka-nri ọkwa ahu, na otù n'aka-ekpe-ya. 4 M'we za, gwa mọ-ozi ahu nke nāgwam okwu, si, Ndia bu gini, onye-nwem? 5 Mọ-ozi ahu nke nāgwam okwu we za, sim, Ì maghi ihe ndia bu? M'we si, É-è, onye-nwem. 6 O we za, gwam okwu, si, Nka bu okwu Jehova nke Ọ gwara Zerubabel, si, Ọ bughi site n'usu-ndi-agha, ọ bughi kwa site n'ike, kama ọ bu site na Mọm, ka Jehova nke usu-ndi-agha siri. 7 Ònye ka i bu, gi oké ugwu? n'iru Zerubabel i gāghọ ebe di lari: ọ gēweputa kwa nkume nke-elu n'itiri ya oké nkpu, si, Amara, amara. 8 Okwu Jehova we ruem nti, si, 9 Aka abua nke Zerubabel atọwo ntọ-ala nke ulo a, aka-ya abua gēwubì kwa ya; i we mara na Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezìwom biakute unu. 10 N'ihi na ònye ledaworo ubọchi ihe ntà anya? n'ihi na ha gāṅuri ọṅu, hu nkume eji atù mb͕idi n'aka Zerubabel, bú asa ndia, ndi bu anya Jehova; ndi ahu nējeghari n'uwa nile. 11 M'we za, si ya, Gini bu osisi olive abua ndia nke di n'aka-nri ebe-idọba-oriọna nka na n'aka-ekpe-ya? 12 M'we za nke ub͕ò abua, si ya, Gini bu ngalaba abua nke osisi olive ndia nke nēsi n'ihe ọla-edo abua eji ab͕apu manu b͕apu manu ọla-edo n'onwe-ha? 13 O we gwam okwu, si, I maghi ihe ndia bu? M'we si, É-è, onye-nwem. 14 Ọ si, Ndia bu umu-ndikom abua nke manu ọhu, ndi nēguzo n'akuku Onye-nwe uwa nka nile.

Zekaraia 5

1 M'we welie anyam abua ọzọ, hu, ma le, akwukwọ-npiakọta nke nēfe efe. 2 O we sim, Gini ka gi onwe-gi nāhu? M'we za, Mu onwem nāhu akwukwọ-npiakọta nēfe efe; ogologo-ya di orú cubit, obosara-ya di kwa cubit iri. 3 O we sim, Nka bu ọb͕ub͕a-iyi nke nāpùru iru ala nka nile: n'ihi na onye ọ bula nke nēzu ori ka agēkpochapu n'ebe a dika o si di; ọ bu kwa onye ọ bula nke nāṅu iyi ka agēkpochapu n'ebe a dika o si di. 4 Emewom ka ọ puta, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), ọ gābà kwa n'ulo onye-ori na n'ulo onye ji aham aṅu iyi ugha: ọ gānọ kwa ọnọdu-abali n'etiti ulo-ya, me ka ọ gwusia, ya na osisi-ya na nkume-ya nile. 5 Mọ-ozi ahu nke nāgwam okwu we puta, sim, Biko, welie anya-gi abua, hu ihe ọ bu, bú ihe a nke nāpu apu. 6 M'we si, Gini ka ọ bu? Ọ si, Nka bu ihe-ọtùtù ephah nke nāpu apu. O we si, Nka bu oyiyi-ha n'ala nka nile: 7 (ma le, otù buruburu opù anēbuli ebuli: ) nka bu kwa otù nwanyi nke nānọdu n'etiti ephah ahu. 8 O we si, Nka bu Nmebi-iwu; o we tubà ya n'etiti ephah ahu: o we tukwasi nkume opù ahu n'ọnu-ya. 9 M'we welie anyam abua, hu, ma le, ndinyom abua nāputa, ifufe di kwa na nkù-ha, n'ihi na ha nwere nkù abua dika nkù ub͕ala: ha we bulie ephah ahu n'etiti ala na elu-igwe. 10 M'we si mọ-ozi ahu nke nāgwam okwu, Òle ebe ka ndia nēbuga ephah ahu? 11 O we sim, Iwuru ya ulo n'ala Shaina: mb͕e edozisiri ya, agādọba ya n'ebe ahu n'ihe-ndọkwasi-ya.

Zekaraia 6

1 M'we welie anyam abua ọzọ, hu, ma le, ub͕ọ-ala anọ nēsi n'etiti ugwu abua puta; ugwu ahu bu ugwu ọla. 2 N'ub͕ọ-ala mbu ka inyinya nācha uhie uhie di; n'ub͕ọ-ala nke-abua ka inyinya nēji nji di; 3 n'ub͕ọ-ala nke-atọ ka inyinya nācha ọcha di; n'ub͕ọ-ala nke-anọ ka inyinya turu agwa nwe-kwa-ra ume di. 4 M'we za, si mọ-ozi ahu nke nāgwam okwu, Gini bu ndia, onye-nwem? 5 Mọ-ozi ahu we za, sim, Ndia bu ifufe anọ nke elu-igwe, ndi nēsi n'iguzo onwe-ha n'iru Onye-nwe uwa nka nile pua. 6 Ub͕ọ-ala ahu nke inyinya nēji nji di nime ya nāpuru ala Ugwu; nke nācha ọcha puso-kwa-ra ha; nke turu agwa puru-kwa-ra ala Ndida. 7 Inyinya nwere ume pu-kwa-ra, chọ ije ka ha we jegharia n'uwa: o we si, J nu, jegharia n'uwa. Ha we jegharia n'uwa. 8 O we kpọsiem òkù ike gwam okwu, si, Le, Ndi ahu nke nāpu rue ala Ugwu emewo ka Mọm zue ike n'ala Ugwu. 9 Okwu Jehova we ruem nti, si, 10 Nara ihe n'aka ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, bú n'aka Heldai, na n'aka Tobaija, na n'aka Jedaia; gi onwe-gi bia kwa n'ubọchi ahu, bata n'ulo Josaia nwa Zefanaia, bú nke ha biaruworo site na Babilon; 11 e, nara ọla-ọcha na ọla-edo, kpua okpu-eze, kpube n'isi Joshua nwa Jehozadak, bú onye-isi-nchu-àjà; 12 gwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha kwuru, si, Le, otù onye nke Ihe-opupú bu aha-ya; ọ bu kwa n'ọnọdu-ya ka ọ gēsi pú, ọ gēwu kwa ulo uku Jehova: 13 ọbuná ya onwe-ya gēwu ulo uku Jehova; ọ bu kwa ya onwe-ya gēburu ebube nile, nọdu nāchi n'oche-eze-ya; otù onye-nchu-àjà gādi kwa n'oche-eze-ya: ndum-ọdu udo gādi kwa n'etiti ha abua. 14 Okpu-eze ahu gādiri Hilem, di-kwa-ra Tobaija, di-kwa-ra Jedaia, di-kwa-ra Hen nwa Zefanaia, ibu ihe-ncheta n'ulo uku Jehova. 15 Ndi nọ n'ebe di anya gābia kwa, wue n'ulo uku Jehova, unu ewe mara na Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezìwom biakute unu. Ọ gēme kwa, ọ buru na unu ege olu Jehova, bú Chinek-unu, nti nke-ọma.

Zekaraia 7

1 O rue, n'arọ nke-anọ nke Daraiọs, bú eze, na okwu Jehova ruru Zekaraia nti, n'ubọchi nke-anọ nke ọnwa nke-iteghete, n'ọnwa Kislev. 2 Ma ndi Bet-el zigarari Shareza na Regem-melek na ndi-ha ime ka iru Jehova dajua, 3 na igwa ndi-nchu-àjà ndi diri ulo Jehova nke usu nile nke ndi-agha okwu, ha na ndi-amuma, si, M'gākwa ákwá n'ọnwa nke-ise, nēkewaputa onwem, dika m'meworo otutu aro ra ka ndia? 4 Okwu Jehova nke usu nile nke ndi-agha we ruem nti, si, 5 Gwa ndi nile nke ala nka, gwa kwa ndi-nchu-àjà, okwu, si, Mb͕e unu buru ọnu, mb͕e unu tiri aka n'obi n'ọnwa nke-ise, na n'ọnwa nke-asa, ọbuná ọgu arọ atọ na iri ndia, ọ̀ bu obubu-ọnu unu buru ma-ọli nye Mu onwem? 6 Ọzọ, mb͕e unu nēri ihe, ma-ọbu mb͕e unu nāṅu ihe-ọṅuṅu, ọ̀ bughi unu onwe-unu bu ndi nēri ihe? ọ̀ bughi kwa unu onwe-unu bu ndi nāṅu ihe-ọṅuṅu? 7 Ùnu agaghi-anu okwu nile nke Jehova kpọsaworo site n'aka ndi-amuma mbu, mb͕e Jerusalem bu ebe madu bi, mb͕e ọ nọ kwa n'udo, mb͕e madu bi kwa n'obodo-ya nile di ya buruburu na nime Negeb na n'ebe di ala ala? 8 Okwu Jehova we rue Zekaraia nti, si, 9 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha kwuru, si, Kpenu ikpe ezi-okwu, nwe-kwa-nu ebere na obi-ebere nile, onye ọ bula n'aru nwa-nne-ya: 10 unu emeb͕u-kwa-la nwanyi di-ya nwuru, na nwa-nb͕ei, na ọbìa, na onye ewedara n'ala; unu echè-kwa-la ihe ọjọ n'obi-unu, onye ọ bula megide nwa-nne-ya. 11 Ha we ju iṅa nti, wezuga ubu-ha, me ka nti-ha di arọ́, ka ha we ghara inu ihe. 12 Ọ bu kwa obi-ha ka ha mere ka ha ghọ nkume adamant, ka ha we ghara inuru iwu Chineke, na okwu nile nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha zitere site na Mọ-Ya site n'aka ndi-amuma mbu: oké iwe we site na Jehova nke usu nile nke ndi-agha bia. 13 O rue na, dika Ọ kpọrọ òkù, ma ha anughi; otú a ka ha gākpọ òkù, ma M'gaghi-anu; otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri; 14 ma M'gēfesa ha dika oké ifufe n'etiti mba nile ndi ha nāmaghi. Ala nka we tọb͕ọrọ n'efu n'azu ha, ghara inwe onye-ngabiga ma-ọbu onye nālata: n'ihi na ha mere ala anāchọsi ike ka ọ ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu.

Zekaraia 8

1 Okwu Jehova nke usu nile nke ndi-agha we bia, si, 2 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ekwoworom Zaion oké ekworo, ejiwokwam oké ọnuma kworo ya ekworo. 3 Otú a ka Jehova siri: Alaghachiwom na Zaion, M'gēbi kwa n'etiti Jerusalem: agākpọ kwa Jerusalem Obodo ezi-okwu; agākpọ kwa ugwu nke Jehova nke usu nile ndi-agha Ugwu nsọ. 4 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Agadi ndikom na agadi ndinyom gānọdu ala ọzọ n'amá nile nke Jerusalem, onye ọ bula o jide nkpa-n'aka-ya n'aka-ya site n'iba-uba nke ubọchi ndu-ya. 5 Amá nile nke obodo ahu gējuputa kwa n'umu-ntakiri ndikom na umu-ntakiri ndinyom nēgwuri egwú n'amá-ya nile. 6 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Asi na ọ dikari ike ime n'anya ndi nka fọduru n'ubọchi ahu, ọ̀ bu kwa n'anyam ka ọ gādi kari ike ime? (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta). 7 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Le, M'gaje izọputa ndim n'ala Ọwuwa-anyanwu, na n'ala Ọdida-anyanwu: 8 M'gēme kwa ka ha bia, ha gēbi kwa n'etiti Jerusalem: ha gābu-kwa-ram otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra ha Chineke, n'ezi-okwu na n'ezi omume. 9 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ka aka-unu di ike, unu ndi nānu n'ubọchi ndia okwu ndia n'ọnu ndi-amuma ahu, ndi nọ n'ubọchi mb͕e atọrọ ntọ-ala ulo Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú ulo uku Ya, ka ewe wue ya. 10 N'ihi na tutu ubọchi nile ahu ugwọ-ọlu madu adighi, ugwọ-ọlu anumanu adighi kwa; ọ dighi kwa udo diri onye nāpu apu ma-ọbu onye nābata abata site n'onye-nkpab͕u: eziga-kwa-ram madu nile, onye ọ bula imegide ibe-ya. 11 Ma ub͕u a ọ bughi dika n'ubọchi mbu nile ka Mu onwem gādiri ndi nka fọduru; (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta). 12 N'ihi na nkpuru udo gādi; osisi vine gāmi nkpuru-ya, ala ēme kwa ihe-ọmume-ya, elu-igwe gēnye igirigi-ha; M'gēme kwa ka ndi nka fọduru keta ihe ndia nile. 13 Ọ gēru kwa na, dika unu buri nkọcha n'etiti mba nile, unu ulo Juda na ulo Israel, otú a ka M'gāzọputa unu, unu aburu ngọzi: unu atula egwu, kama ka aka-unu di ike. 14 N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Dika M'zubere ime unu ihe ọjọ, mb͕e nna-unu-hà kpasurum iwe, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), ma echègharighm uche: 15 otú a ka M'zubewo-kwa-ra ọzọ n'ubọchi ndia ime Jerusalem, ime kwa ulo Juda, nma: unu atula egwu. 16 Ndia bu ihe unu gēme; Kwuenu, onye ọ bula ọ gwa ibe-ya, ezi-okwu; Kpenu ikpe ezi-okwu na ikpe udo n'ọnu-uzọ-ama nile unu: 17 unu echè-kwa-la ihe ọjọ n'obi-unu, onye ọ bula megide ibe-ya; unu ahu-kwa-la ọb͕ub͕a-iyi ugha n'anya: n'ihi na ihe ndia nile bu ihe nke M'kpọworo asì; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 18 Okwu Jehova nke usu nile nke ndi-agha we ruem nti, si, 19 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Obubu-ọnu nke ọnwa nke-anọ, na obubu-ọnu nke ọnwa nke-ise, na obubu-ọnu nke ọnwa nke-asa, na obubu-ọnu nke ọnwa nke-iri, gāghọrọ ulo Juda obi-utọ na ọṅù, na mb͕e akara àkà di nma; hu-kwa-nu ezi-okwu na udo n'anya. 20 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ọ gēru kwa ọzọ na ndi di iche iche na ndi bi n'ọtutu obodo gābia: 21 ndi bi n'otù obodo gējekuru kwa obodo ọzọ, si, Ka ayi jisie ike je ime ka iru Jehova dajua, na ichọ Jehova nke usu nile nke ndi-agha: m'gēje, ọbuná mu onwem. 22 E, ọtutu ndi di iche iche na mba di iche iche di ike gābia ichọ Jehova nke usu nile nke ndi-agha nime Jerusalem, na ime ka iru Jehova dajua. 23 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Na mb͕e ahu ka ndikom iri gēsi n'asusu nile nke mba nile jide, ọbuná ijide ọnu-ọnu-ala uwe nwoke bu onye-Ju, si, Ayi na unu gāyikọ je, n'ihi na ayi anuwo na Chineke nọyere unu.

Zekaraia 9

1 Ibu okwu Jehova nke eboro ala Hadrak, Damaskọs gābu kwa ebe-izu-ike-ya: n'ihi na n'ebe Jehova nọ ka anya madu na nke mba nile nke Israel di: 2 na Hemat nke nwe-kwa-ra ókè-ala-ya: Taia na Zaidon, n'ihi na ọ mara ihe nke-uku. 3 Taia we wuere onwe-ya ebe ewusiri ike, tukọba ọla-ọcha dika ájá, na ọla-edo ọma dika apiti nke amá. 4 Le, Onye-nwe-ayi gānapu ya ala-ya, tikue ike-ya n'oké osimiri, ọ bu kwa ya onwe-ya ka ọku gēripia. 5 Ashkelon gāhu ya, tua egwu; Geza kwa, ọ gāb͕ali kwa nke-uku; Ekron kwa, n'ihi na ihere gēme ntukwasi-obi-ya: eze gālanari kwa Geza n'iyi, madu agaghi-ebi kwa n'Ashkelon. 6 Nwa iko gēbi kwa n'Ashdod, M'gēbipu kwa npako ndi Filistia. 7 M'gēwezuga kwa ọbara nile ya n'ọnu-ya, wezuga kwa ihe-árú-ya nile n'etiti ezé-ya; ọ gāfọdu-kwa-ra Chineke-ayi, ọbuná ya onwe-ya: ọ gādi kwa ka otù onye-isi nke nnù madu abua na ọgu iri nime Juda, Ekron gādi kwa ka onye Jebus. 8 M'gāma-kwa-ra ulom ulo-ikwū, dika ebe-nguzo-ndi-agha, n'ihi onye-ngabiga na n'ihi onye nālata: ka onye nāchi n'ihe-ike we ghara igabiga kwa n'akuku ha ọzọ: n'ihi na ub͕u a ka M'jiworo anyam abua hu. 9 Tegharia egwú ọṅù nke-uku, gi ada Zaion; tie nkpu, gi ada Jerusalem: le, eze-gi nābiakute gi: onye ezi-omume na onye nwere nzọputa ka ọ bu; onye ewedara n'ala, nke nānọkwasi kwa n'inyinya-ibu, ọbuná na nwa-inyinya, bú nwa-inyinya-ibu. 10 M'gēbipu kwa ub͕ọ-ala n'Efraim, bipu kwa inyinya na Jerusalem, agēbipu kwa uta agha; Ọ gāgwa kwa mba nile okwu udo: Ọ gāchi kwa achi site n'otù oké osimiri rue oké osimiri ọzọ, site kwa n'Osimiri rue nsọtu nile nke uwa. 11 Gi onwe-gi kwa, n'ihi ọbara ọb͕ub͕a-ndu-gi ka M'zipuworo ndi-nkpọrọ-gi n'olùlù nke miri nādighi nime ya. 12 Laghachinu n'ebe ewusiri ike, unu ndi-nkpọrọ nke olile-anya ahu: ọbuná ta ka M'nēgosi na ọ bu okpukpu abua ka M'gēnyeghachi gi. 13 N'ihi na azọworom Onwem Juda ukwu ikwe ya dika uta, uta ahu ka M'mejuworo n'Efraim dika àkú; M'gākpọte kwa umu-gi, Zaion, imegide umu-gi, Jevan, M'gēme kwa gi ka i di ka mma-agha dike. 14 Ọ bu kwa Jehova ka agāhu n'elu ha, àkú-Ya gāpu kwa dika àmùmà: Onye-nwe-ayi Jehova gāfù kwa opì-ike, je ije n'oké ifufe di iche iche nke Ndida. 15 Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēb͕ochi ha; ha gēripia kwa, zọda nkume èbè nile; ha gāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, me nkpọtu dika site na manya-vine: ha gējuputa kwa dika ọkwa-nwusa, dika nkuku nile nke ebe-ichu-àjà. 16 Jehova, bú Chineke-ha, gāzọputa kwa ha n'ubọchi ahu dika ìgwè ewu na aturu ahu, bú ndi-Ya: N'ihi na nkume di oké ọnu-ahia nke okpu-eze ka ha gābu, ndi eweliworo elu dika ọkọlọtọ n'elu ala-Ya. 17 N'ihi na le ka idi-nma-Ya si di uku! le kwa ka ima-nma-Ya si di uku! ọka gemeka umu-okorọbia tozue okè nke-ọma, manya-vine ọhu kwa umu-ab͕ọghọ nke nāmaghi nwoke.

Zekaraia 10

1 Riọnu Jehova miri-ozuzo n'oge miri-ozuzo nke-ikpe-azu, ọbuná Jehova Nke nēme àmùmà; ọ bu kwa oké miri-ozuzo ka Ọ gēnye ha, nye onye ọ bula ihe-ọkukù n'ubi-ya. 2 N'ihi na teraphim ekwuwo ajọ ihe, ndi nāju ase ahuwo ọhù ugha; ọ bu kwa nrọ ugha ka ha nēzi, n'efu ka ha nākasi madu obi: n'ihi nka ka ha buliworo ije dika ìgwè ewu na aturu, anēweda ha n'ala, n'ihi na ọ dighi onye-ọzùzù-aturu ha nwere. 3 N'aru ndi-ọzùzù-aturu ka iwem di ọku, ọ bu kwa nkpi nile ka M'gēji nmehie-ha leta: n'ihi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha eletawo ìgwè ewu na aturu-Ya, bú ulo Juda, Ọ gēme kwa ha ka ha di ka inyinya-Ya di ebube n'agha. 4 N'aka-Ya ka nkume nkuku gēsi puta, n'aka-Ya ka ǹtú gēsi puta, n'aka-Ya ka uta agha gēsi puta, n'aka-Ya ka onye ọ bula nāchi n'ihe-ike gēsi puta n'otù. 5 Ha gādi kwa ka ndi-dike, nāzọda ndi-iro-ha n'apiti èzí nile n'agha; ha gēbu kwa agha, n'ihi na Jehova nọyere ha: ihere gēme kwa ndi nānọkwasi inyinya. 6 M'gēme kwa ka ulo Juda di ike, M'gāzọputa kwa ulo Josef, me ka ha lata, n'ihi na enwerem obi-ebere n'aru ha: ha gādi kwa ka agāsi na achupughm ha-ri: n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-ha, M'gāza kwa ha. 7 Ndi Efraim gādi kwa ka dike, obi-ha gāṅuri kwa ọṅu dika site na manya-vine: e, umu-ha gāhu ya, we ṅuria; obi-ha gēteghari egwú ọṅù nime Jehova. 8 M'gākpọkọta kwa ha òkù, chikọta ha; n'ihi na ab͕aputawom ha: ha gāba kwa uba otú ha baworo uba. 9 M'gāgha kwa ha dika nkpuru n'etiti ndi nile di iche iche; ọ bu kwa n'ebe nile di anya ka ha gēchetam: ha gādi kwa ndu, ha na umu-ha, we lata. 10 M'gēme kwa ka ha si n'ala Ijipt lata, ọ bu kwa n'Asiria ka M'gāchikọputa ha; ọ bu kwa ala Gilead na Lebanon ka M'gēme ka ha bata; agaghi-ahu-kwa-ra ha ọnọdu. 11 Ọ gāgabiga kwa n'oké osimiri nke nkpab͕u, tie oké osimiri nke ọtutu nmali-miri, ebe di omimi nile nke Nail gātakọrọ kwa: agēbuda kwa npako Asiria n'ala, nkpa-n'aka Ijipt gēwezuga kwa onwe-ya. 12 M'gēme kwa ka ha di ike nime Jehova; ọ bu kwa n'aha-Ya ka ha ganējeghari; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

Zekaraia 11

1 Meghe uzọ-gi nile, gi Lebanon, ka ọku we ripia osisi cedar gi nile. 2 Kwasie ákwá ike, gi osisi fir, n'ihi na osisi cedar adawo, n'ihi na emebiwo osisi nke mab͕uru onwe-ha: kwasienu ákwá ike, unu osisi oak nke Beshan, n'ihi na oké ọhia alùgh-alù adawo. 3 Ge nti, ọ bu olu nke ikwasi-ákwá-ike nke ndi-ọzùzù-aturu! n'ihi na emebiwo ebube-ha: ge nti, ọ bu olu ib͕ọ-uja nke umu-ọdum! n'ihi na emebiwo nbili-elu nke Jọdan. 4 Otú a ka Jehova, bú Chinekem, siri: Nāzù ìgwè ewu na aturu agēb͕u eb͕u; 5 nke ndi nāzù ha nēb͕u ha, ma ikpe adighi-ama ha; ọzọ, ndi nēre ha nāsi, Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, n'ihi na abum ọgaranya: ndi-ọzùzù-ha adighi-enwe ọmiko n'aru ha. 6 N'ihi na M'gaghi-enwe kwa ọmiko ọzọ n'aru ndi bi n'ala nka, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): ma, le, Mu onwem gaje irara madu ndia nye, onye ọ bula n'aka ibe-ya na n'aka eze-ya: ha gētib͕u kwa ala nka, M'gaghi-anaputa kwa ha n'aka-ha. 7 M'we zùa ìgwè ewu na aturu agēb͕u eb͕u, n'ezie ọ bu ndi ewedara n'ala nke ìgwè ewu na aturu ahu. M'we chiri n'onwem nkpa-n'aka abua; otù ka m'kpọrọ Idi-utọ, nke-ọzọ ka m'kpọrọ Ndi-ọ̀tú-udọ̀, m'we zùa ìgwè ewu na aturu. 8 M'we bipu ndi-ọzùzù-aturu atọ ahu n'otù ọnwa; nkpuru-obim enweghi kwa ntachi-obi n'aru ha, ọzọ, nkpuru-obi-ha asọwokwam oyi. 9 M'we si, M'gaghi-azù unu: nke nānwu anwu, ya nwua; nke anēbipu ebipu, ka ebipu ya; ka ndi fọduru rie, aturu ọ bula anu-aru ibe-ya. 10 M'we were nkpa-n'akam, bú Idi-utọ, b͕ujira ya abua, imebi ọb͕ub͕a-ndum nke Mu na ndi nile di iche iche b͕ara. 11 Ewe nyajie ya n'ubọchi ahu: otú a ndi ewedara n'ala nke ìgwè ewu na aturu ahu, bú ndi nāribam ama, we mara na okwu Jehova ka ọ bu. 12 M'we si ha, Ọ buru na ọ di nma n'anya-unu, nyenum ugwọ-ọlum; ma ọ dighi, gharanu. Ha we tùa ugwọ-ọlum, bú orú ego ọla-ọcha na iri. 13 Jehova we sim, Tufue ya nye ọkpu-ite, bú ọnu-ahia mab͕uru onwe-ya nke ha rùrum. M'we chiri orú ego ọla-ọcha na iri ahu, tufue ha nye ọkpu-ite, n'ulo Jehova. 14 M'we b͕ujira nkpa-n'akam nke-abua, bú Ndi-ọ̀tú-udọ̀, imebi nwa-nne Juda na Israel bu. 15 Jehova we sim, Were kwa n'onwe-gi ọzọ ihe nke onye-ọzùzù-aturu nke b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya. 16 N'ihi na, le, Mu onwem gaje ime ka otù onye-ọzùzù-aturu bilie n'ala nka, ọ gaghi-elekọta ndi ebipuru ebipu, ọ gaghi-achọ nke achusara achusa, ọ gaghi-agwọ nke ab͕ajiri ukwu na aka; ọ gaghi-azù nke nēguzo eguzo, ma anu nke aturu mara abuba ka ọ gēri, ukwu nile ha ka ọ gānyajisi. 17 Ahuhu diri onye-ọzùzù-aturu efu nke nārapu ìgwè ewu na aturu! mma-agha gādakwasi n'ogwe-aka-ya na n'anya-ya nke aka-nri: ogwe-aka-ya gākpọsi nku, anya aka-nri ya gāhu kwa inyoghi-inyoghi nke-uku.

Zekaraia 12

1 Ibu okwu Jehova eboro Israel. Ihe si n'ọnu Jehova puta, bú Onye nēseti elu-igwe, nātọ kwa ntọ-ala uwa, nākpu kwa mọ madu nime ya: 2 Le, Mu onwem gaje ime Jerusalem ka ọ ghọrọ ndi nile di iche iche ndi di ya buruburu ọkwa nṅaghari, ọ bu kwa n'aru Juda ka ọ gādi nime nnọchigide-n'agha ahu agānọchigide Jerusalem. 3 Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na M'gēme Jerusalem ka ọ ghọrọ ndi nile di iche iche nkume ebubo; ndi nile ndi ji ya ebo onwe-ha gākọwaputa onwe-ha ọnyá nke-uku; mba nile nke uwa gāchikọta kwa onwe-ha imegide ya. 4 N'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gēji ibobo tib͕ue inyinya ọ bula, ji kwa ara-ọwiwi tib͕ue onye nānọkwasi ya: ọ bu kwa ulo Juda ka M'gāsaghe anyam abua lekwasi, ọ bu inyinya nile ọ bula nke ndi nile di iche iche ka M'gēji ikpu-ìsì tib͕ue. 5 Ndi-isi nke usu nile nke nnù madu abua na ọgu iri nke Juda gāsi kwa n'obi-ha, Ume m'nwere ka ndi bi na Jerusalem gābu nime Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke-ha. 6 N'ubọchi ahu ka M'gēme ka ndi-isi nke usu nile nke nnù madu abua na ọgu iri nke Juda di ka ihe igu ọku n'etiti nkú, na dika ọwa nēnwu ọku n'etiti ùkwù-ọka; ha gēripia kwa ndi nile di iche iche di ha buruburu n'aka-nri na n'aka-ekpe: Jerusalem gēbi kwa ọzọ n'onodu-ya, obuná nime Jerusalem. 7 Jehova gēbu kwa uzọ zọputa ulo-ikwū nile nke Juda, ka ima-nma nke ulo Devid na ima-nma nke ndi bi na Jerusalem we ghara idi uku n'elu Juda. 8 N'ubọchi ahu ka Jehova gēb͕ochi ndi bi na Jerusalem; onye nāsu ngọngọ n'etiti ha n'ubọchi ahu gādi kwa ka Devid; ulo Devid gādi kwa ka Chineke, dika mọ-ozi nke Jehova n'iru ha. 9 Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na M'gāchọ ikpochapu mba nile ndi nābia imegide Jerusalem. 10 M'gāwukwasi kwa n'ulo Devid na n'aru onye bi na Jerusalem, mọ nke amara na aririọ-amara nile; ha gēlegidekwam anya, bú Onye ha mapūworo amapú: ha gēti-kwa-ra ya aka n'obi, dika madu si eti-kwa-ra nwa-nwoke amuru nání ya aka n'obi, obi-ha gēlu kwa ilu bayere ya, dika onye obi-ya nēlu ilu bayere nwa o buru uzọ mu. 11 N'ubọchi ahu oké otiti-aka-n'obi gādi na Jerusalem, dika otiti-aka-n'obi nke Hedad-rimon nime ndagwurugwu Megidon. 12 Ala nka gēti kwa aka n'obi, ab͕uru ọ bula iche; ab͕uru ulo Devid iche, na ndinyom-ha iche; ab͕uru ulo Netan iche, na ndinyom-ha iche; 13 ab͕uru ulo Livai iche, na ndinyom-ha iche; ab͕uru ndi Shimai iche, na ndinyom-ha iche; 14 ab͕uru nile ndi fọduru, ab͕uru ọ bula iche, na ndinyom-ha iche.

Zekaraia 13

1 N'ubọchi ahu isi-iyi gādi nke ghere oghe nye ulo Devid, nye kwa ndi bi na Jerusalem, bayere nmehie baye-kwa-ra ọrurú. 2 Ọ gēru kwa n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), na M'gēbipu aha nile nke arusi nile n'ala nka, agaghi-echeta kwa ha ọzọ: ọzọ kwa, M'gēme ka ndi-amuma na mọ nke iru-árú si n'ala nka gabiga. 3 Ọ gēru kwa, mb͕e onye ọ bula gēbu kwa amuma ọzọ, na nna-ya na nne-ya ndi muru ya gāsi ya, I gaghi-adi ndu; n'ihi na okwu-ugha ka i kwuworo n'aha Jehova: nna-ya na nne-ya ndi muru ya gāmapú ya mb͕e o nēbu amuma. 4 Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na ihere gēme ndi-amuma, onye ọ bula n'ọhù-ya, mb͕e o nēbu amuma; ha agaghi-eyiri kwa uwe-nwuda nke aji-anu ka ha we ghọ aghughọ: 5 ma ọ gāsi, Ọ dighi onye-amuma m'bu, onye-ọlu-ubi ka m'bu; n'ihi na madu mere ka ab͕atam site na mb͕e m'di na nwata. 6 Agāsi kwa ya, Gini bu ntiputa-ọnyá ndia n'etiti aka-gi abua? Ọ gāsi kwa, Ha bu ọnyá etiputaram n'ulo ndi nāhum n'anya. 7 Teta, gi mma-agha, imegide Onye-ọzùzù-aturum, na imegide nwoke ahu nke bu ibem, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta): tib͕ue Onye-ọzùzù-aturu ahu, agāb͕asa kwa ìgwè ewu na aturu; M'gēchighari kwa akam imegide ndi ntà. 8 Ọ gēru kwa, n'ala nka nile, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na uzọ abua nime ya ka agēbipu, ha kubìe ume; ma uzọ nke-atọ gāfọdu nime ya. 9 M'gēme kwa ka uzọ nke-atọ ba n'ọku, M'gānucha kwa ha dika esi anucha ọla-ọcha, nwa ha dika esi anwa ọla-edo: ndi ahu gākpọku aham, Mu onwem gāza kwa ha: M'gāsi, Ndi nkem ka ọ bu; ndi ahu gāsi kwa, Jehova bu Chinekem.

Zekaraia 14

1 Le, otù ubọchi nābiara Jehova, mb͕e agēkesa ihe-nkwata-gi n'etiti gi. 2 M'gāchikọta kwa mba nile ibuso Jerusalem agha; agēwere kwa obodo a, punara ya ulo-ya nile, merua ndinyom-ya: nkera obodo a gāpu buru ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ma agaghi-ebipu ndi nka fọduru n'obodo a. 3 Jehova gāpu kwa, buso mba ahu nile agha, dika n'ubọchi O buru agha n'ubọchi ilu-ọ̀gù. 4 Ukwu-Ya abua gēguzo kwa n'ubọchi ahu n'elu ugwu Olive, nke di n'iru Jerusalem n'Iru-anyanwu, ugwu Olive gāb͕awa kwa n'etiti abua ya n'akuku Ọwuwa-anyanwu na n'akuku Ọdida-anyanwu, oké ndagwurugwu di uku ewe di; nkera ugwu ahu gāpuzuga n'akuku Ugwu, nkera-ya n'akuku Ndida. 5 Unu gēsi kwa na ndagwurugwu ugwum nile b͕alaga; n'ihi na ndagwurugwu ugwu ahu gēru Eze: e, unu gāb͕alaga, dika unu siri n'iru ala-ọma-jijiji b͕alaga n'ubọchi Uzaia, bú eze Juda: Jehova, bú Chinekem, gābia kwa, ndi nsọ nile gēsoro Gi. 6 Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na ìhè agaghi-adi, ìhè nēnwu enwu gāb͕achi: 7 ma ọ gābu otù ubọchi nke Jehova mara: ọ bughi ehihie, ọ bughi kwa abali: ma o gēru, na ìhè gādi na mb͕e anyasi. 8 Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na miri nēnye ndu gēsi na Jerusalem rùputa; nkera-ha gērùga n'oké osimiri Iru-anyanwu, nkera-ha gērùga kwa n'oké osimiri Ọdida-anyanwu: na mb͕e okpom-ọku na na mb͕e oyi ka ọ gadi. 9 Jehova gāghọ kwa eze elu-uwa nile: n'ubọchi ahu ka Jehova gādi otù, aha-Ya gādi kwa otù. 10 Ala nka nile gāghọ ihe di ka Araba, site na Geba rue Rimon na Ndida Jerusalem: agēbuli kwa ya elu, ọ gēbi kwa n'ọnọdu-ya, site n'ọnu-uzọ-ama Benjamim rue ebe ọnu-uzọ-ama mbu, rue ọnu-uzọ-ama nke nkuku, site kwa n'ulo-elu Hananel rue ebe-nzọcha-nkpuru-vine nile nke eze. 11 Agēbi kwa nime ya, nwezuga ka ebibie ya agaghi-adi kwa ọzọ; Jerusalem gēbi kwa na ntukwasi-obi. 12 Nka gābu kwa ihe-otiti nke Jehova gēji ti ndi nile di iche iche ndi busoworo Jerusalem agha: anu-aru-ha nile n'otù n'otù gātasi ata mb͕e ha onwe-ha nēguzo n'ukwu-ha, anya-ha gātasi kwa ata n'oghere-ha, ire-ha gātasi kwa ata n'ọnu-ha. 13 Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na oké ọb͕ub͕a-aghara nke Jehova gādi n'etiti ha; ha gējide kwa, onye ọ bula o jide ibe-ya aka, aka-ya gēbili kwa imegide aka madu-ibe-ya. 14 Ọzọ, Juda gēbuso kwa Jerusalem agha; agēkpokọta kwa àkù mba nile di buruburu, bú ọla-edo na ọla-ọcha na uwe bara uba nke-uku. 15 Otú a ka ihe-otiti nke inyinya na inyinya mule na camel na inyinya-ibu na anumanu ọ bula nke gādi n'ulo-ikwū ndia gādi, dika ihe-otiti a. 16 Ọ gēru kwa, na onye ọ bula nke fọduru n'etiti mba nile ndi nābia imegide Jerusalem gārigo kwa-arọ ikpọ isi ala nye Eze, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, na ime ememe ulo-ntu. 17 Ọ gēru kwa, na ab͕uru ọ bula n'etiti ab͕uru nile nke uwa nke nādighi-arigota na Jerusalem ikpọ isi ala nye Eze, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, miri agaghi-ezokwasi ha. 18 Ọ buru kwa na ab͕uru Ijipt adighi-arigobata, ọ̀ gaghi-adi n'aru ha, bú ihe-otiti, nke Jehova gēji ti mba nile ndi nādighi-arigo ime ememe ulo-ntu? 19 Nka gābu ahuhu-nmehie nke Ijipt, na ahuhu-nmehie nke mba nile ndi nādighi-arigo ime ememe ulo-ntu. 20 N'ubọchi ahu ka IHE NSỌ JEHOVA NWERE gādi n'elu ataṅu nile nke inyinya; ite nile n'ulo Jehova gādi kwa ka ọkwa-nwusa di n'iru ebe-ichu-àjà. 21 E, ite ọ bula nke di na Jerusalem, ma-ọbu nke di na Juda, gābu ihe nsọ Jehova nke usu nile nke ndi-agha nwere: ndi nile ndi nāchu àjà gābia kwa chiri ufọdu nime ha, sie ihe nime ha: ọ dighi kwa onye Kenean gādi ọzọ n'ulo Jehova nke usu nile nke ndi-agha n'ubọchi ahu.

Malakai 1

1 Ibu okwu Jehova eboro Israel site n'aka Malakai. 2 Ahuwom unu n'anya, ka Jehova siri. Ma unu nāsi, Nìme gini ka I huworo ayi n'anya? Isọ, ọ̀ bughi nwa-nne Jekob? (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): otú ọ di, anamahu Jekob n'anya; 3 ma Isọ ka M'kpọworo asì, me ugwu-ya nile ka ha ghọ ebe tọḅọrọ n'efu, M'were ihe-nketa-ya nye nkita-ọhia nile nke ọzara. 4 Ọ bu ezie na Edom nāsi, Etituwo ayi, ma ayi gēwughachi nkpọnkpọ ebe nile; otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Ndi ahu gēwu, ma Mu onwem gākwatu: agākpọ kwa ha Ókè-ala nmebi-iwu, na Ndi ahu nke Jehova wesaworo oké iwe rue mḅe ebighi-ebi. 5 Anya-unu gāhu kwa, unu onwe-unu gāsi kwa, Jehova di uku rue ofè ókè-ala Israel. 6 Nwa nāsọpuru nna-ya, orù nāsọpuru kwa onye-nwe-ya: ọ buru kwa na nna ka M'bu, òle ebe nsọpurum di? ọ buru kwa na onye-nwe-madu ka M'bu, òle ebe egwum di? ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri unu, unu ndi-nchu-àjà, ndi nēlelì aham. Ma unu asiwo, Nìme gini ka ayi lelìworo aha-Gi? 7 Unu nēweta nso achicha emere ka ọ ghara idi nsọ n'elu ebe-ichu-àjàm. Ma unu nāsi, Nìme Gini ka ayi meworo Gi ka I ghara idi nsọ? N'isi, Table nke Jehova, ihe nlelì ka ọ bu. 8 Ọzọ, mḅe unu nēweta anu kpuru ìsì nso, ihe ọjọ adighi ya! mḅe unu nēweta nso nke gwọrọ ngwurọ na nke nāria ọria, ihe ọjọ adighi ya! Biko, weta ya nso onye nāchi ala-gi; ìhe-gi gātọ ya utọ? ma-ọbu ọ̀ gāhu gi iru-ọma? otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri. 9 Ma uḅu a, biko, menu ka iru Chineke dajua, ka O we mere ayi amara: ọ bu site n'aka-unu ka nka diworo: Ọ̀ gāhu onye ọ bula nime unu iru-ọma? ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: 10 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na otù onye di n'etiti unu nke nēmechi uzọ, ka unu we ghara ifunwu ọku nke ebe-ichu-àjàm n'efu! ọ dighi ihe-unu nātọm utọ, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, M'gaghi-anara kwa onyinye-inata-iru-ọma n'aka-unu nke-ọma. 11 N'ihi na site n'ọwuwa anyanwu we rue ọdida-ya aham di uku n'etiti mba nile; ọ bu kwa n'ebe nile ọ bula ka anēweta nso aham ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ na onyinye-inata-iru-ọma di ọcha: n'ihi na aham di uku n'etiti mba nile, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri. 12 Ma unu onwe-unu nēme ka ọ ghara idi nsọ, n'isi, Table nke Jehova, ihe emere ka ọ ghara idi nsọ ka ọ bu, nkpuru-ya, bú ihe-oriri-Ya, bu kwa ihe-nlelì. 13 Unu asiwo kwa, Le, ka o si buru oké ike-ọgwugwu! unu afùwo kwa ya na nlelì, ka Jehova nke ndi-agha siri; unu ewebatawo kwa ihe anapuru n'ike, na ihe gwọrọ ngwuro, na nāria ọria; otú a ka unu webataworo onyinye-inata-iru-ọma: #M'gānara nka nke-ọma nāka-unu? ka Jehova siri. 14 Ma onye anābu ọnu ka onye-nghọḅu ahu bu, nke oké di n'ìgwè aturu-ya, ma ọ nēkwe nkwa, we chuara Onye-nwe-ayi àjà ihe biriri ebibi: n'ihi na eze uku ka M'bu, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, aham di kwa egwu n'etiti mba nile.

Malakai 2

1 Ma uḅu a, unu ka ihe a enyere n'iwu diri, unu ndi-nchu-àjà. 2 Ọ buru na unu agaghi-anu, ọ buru kwa na unu agaghi-etiye ya n'obi-unu, inye aham nsọpuru, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, M'gēzite kwa ọbubu-ọnu ahu n'aru unu, bua ngọzi nile unu ọnu: e, abuwokwam ha ọnu, n'ihi na unu adighi-etiye ya n'obi. 3 Le, M'gaje ibasiri nkpuru-ọghigha nba ike n'ihi unu, fesa unu ǹsí-anu n'iru, bú ǹsí-anu nke anu ememe nile unu; agēbupu unu je n'ebe ọ di. 4 Unu ewe mara na eziteworom unu ihe a enyere n'iwu, ka ọḅuḅa-ndum we diyere Livai, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri. 5 Ọgbugha-ndum diyere ya, bú ndu na udo; M'we nye ya ha dika ihe-egwu, o we tua egwum, ọ bu kwa aham ka ya onwe-ya turu ujọ ya. 6 Iwu nke ezi-okwu di n'ọnu-ya, ahughi kwa ajọ omume n'eḅuḅere-ọnu-ya: n'udo na n'izi-ezi ka o sorom je ije, ọ di kwa ọtutu madu o mere ka ha si n'ajọ omume chigharia. 7 N'ihi na eḅuḅere-ọnu abua nke onye-nchu-àjà gēdebe ihe-ọmuma, ọ bu kwa iwu ka ha gāchọ n'ọnu-ya: n'ihi na onye-ozi nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha ka ọ bu. 8 Ma unu onwe-unu ewezugawo onwe-unu n'uzọ Chineke; unu emewo ka ọtutu madu su ngọngọ n'iwu; unu ebibiwo ọḅuḅa-ndu Livai, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri. 9 Ma Mu onwem emewo kwa ka unu buru ndi anēlelì na ndi di ala n'iru ndim nile, dika unu nādighi-esi edebe uzọm nile, kama unu nāhu madu iru-ọma n'iwu. 10 Ọ̀ bughi otù Nna ka ayi nile nwere? ọ̀ bughi otù Chineke keworo ayi? gini mere ayi nāghọḅu, onye ọ bula ọ ghọḅu ibe-ya, nēme ka ọḅuḅa-ndu nna-ayi-hà ghara idi nsọ? 11 Juda aghọḅuwo nghọḅu, ọ bu kwa ihe-árú ka emeworo n'Israel na nime Jerusalem; n'ihi na Juda emewo ka idi-nsọ Jehova nke Ọ huworo n'anya ghara idi nsọ, ọ luwo kwa nwa-nwan yi nke chi ala ọzọ. 12 Jehova gēbipuru onye ahu nke nēme nka onye nēteta eteta na onye nāza aza, n'ulo-ikwū nile nke Jekob, ya na onye nēwetara Jehova nke usu nile nke ndi-agha nso onyinye-inata-iru ọma. 13 Ọ bu kwa nka nke mere ya abua ka unu nēme: unu ji anya-miri na ikwa-ákwá na isu-udè ekpuchi ebe-ichu-àjà Jehova, O we ghara iche kwa onyinye-inata-iru-ọma ọzọ, ọ tọghi kwa Ya utọ inara ya n'aka-unu. 14 Ma unu asiwo, N'ìhi gini? N'ihi na Jehova aburuwo onye-àmà n'etiti gi na nwunye i lutara n'okorọbia, onye gi onwe-gi ghọḅuworo, ọ bu ezie na ya onwe-ya bu nwan yi ejikọtara gi na ya, na nwunye ọḅuḅa-ndu-gi. 15 Ọ̀ bughi kwa nání otù ka O mere, ọ bu ezie na O nwere mọ fọduru? Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka O mere nání otù? Ọ nāchọ nkpuru nke Chineke. N'ihi nka lezienu anya nime mọ-unu, ka nwoke ghara kwa ighọḅu nwunye ọ lutara n'okorọbia. 16 N'ihi na Ọ kpọwo nchupu-nwunye asì, otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, ya na onye ji ihe-ike ekpuchi uwe-ya, otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: n'ihi nka lezienu anya nime mọ-unu, ka unu we ghara ighọḅu. 17 Unu ejiwo okwu nile unu me ka ike gwu Jehova. Ma unu nāsi, Nìme gini ka ayi meworo ka ike gwu Ya? N'isi, Onye ọ bula nke nēme ihe ọjọ di nma n'anya Jehova, ọ bu kwa ihe-ha nātọ Ya onwe-ya utọ; ma-ọbu òle ebe Chineke nke ikpé nọ?

Malakai 3

1 Le, Mu nēziga onye-ozim, o gēdozi kwa uzọ n'irum Onye-nwe-unu ahu unu onwe-unu nāchọ gābiaru ulo uku Ya na mberede; ọbuná Onye-ozi ọḅuḅa-ndu ahu, Onye ihe-Ya nātọ unu utọ, le Ọ nābia, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri. 2 Ma ònye gānagide ubọchi ọbibia-Ya? ọ̀ bu kwa onye ganēguzogide mḅe anāhu Ya anya? n'ihi na Ya onwe-ya di ka ọku onye-nnucha-ihe na dika nchà nke ọsu-ákwà: 3 Ọ gānọdu kwa ala dika onye-nnucha ọla-ọcha nke nēme ka ọ di ọcha, Ọ gēme kwa ka umu Livai di ọcha, sicha kwa ha dika ọla-edo na ọla-ọcha; ha ganēweta nso Jehova onyinye-inata-iru-ọma n'ezi omume. 4 Onyinye-inata-iru-ọma nke Juda na Jerusalem gātọ kwa Jehova utọ, dika n'ubọchi mḅe ebighi-ebi gara aga, na dika n'arọ nile gara aga. 5 M'gābiakute unu nso ikpe ikpé; M'gābu kwa onye-àmà di ngwa megide ndi-mḅasi, na imegide ndi nākwa iko, na imegide ndi nāṅu iyi ugha, na imegide ndi nēmeḅu onye egoro ọlu n'ugwọ lu-ya na nwan yi di-ya nwuru na nwa-nḅei, ndi nēwezuga kwa ọbìa n'ihe-ya, ndi nādighi-atu agwu m, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri. 6 N'ihi na Mu onwem, bú Jehova, aḅanweghi; ya bu na emeghi ka unu onwe-unu gwusia, umu Jekob. 7 Site n'ubọchi nile nke nna-unu-hà ka unu wezugaworo onwe-unu n'ukpurum nile, unu edebeghi kwa ha. Laghachikutenum, Mu onwem gālaghachikute kwa unu, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri. Ma unu nāsi, Nìme gini ka ayi gālaghachi? 8 Madu, ọ̀ gāpunara Chineke ihe? ma unu nāpunaram ihe. Ma unu nāsi, Nìme gini ka ayi punaraworo Gi ihe? N'otù uzọ n'uzọ iri nile na àjà-nbuli nile. 9 Ọbubu-ọnu ka eji abu unu onwe-unu; ọ bu kwa Mu ka unu onwe-unu nāpunara ihe, bú mba nka nile. 10 Webatanu otù uzọ n'uzọ iri nile n'ulo-àkù nkem, ka ihe-oriri we di n'ulom, biko, nwanum na nka, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, ma M'gaghi-emeghere unu window nile nke elu-igwe, wusara unu ngọzi, rue mḅe ọnọdu agaghi-ezu inagide ya. 11 M'gābasi-kwa-ra ihe nēripia eripia nba ike n'ihi unu, ọ gaghi-ebibi-kwa-ra unu nkpuru ala-ubi-unu; osisi vine unu agaghi-atupu nkpuru-ya n'ubi tutu oge-ya eru, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri. 12 Ọ bu kwa Ndi ihe nāgara nke-ọma ka mba nile gākpọ unu: n'ihi na unu onwe-unu gābu ala nke nātọ utọ, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri. 13 Okwu nile unu adiwo ike imegidem, ka Jehova siri. Ma unu nāsi, Gini ka ayi kwuritaworo megide Gi? 14 Unu asiwo, Ọ bu ihe-efu ifè Chineke òfùfè: ọ̀ bu kwa urù gini ka ọ bara ayi na ayi edebewo ihe-ndebe-Ya, na ayi ejeghariwo kwa n'uwe-iḅa-nkpe n'iru Jehova nke usu nile nke ndi-agha? 15 Ma uḅu a ayi onwe-ayi nākpọ ndi-nganga ndi ihe nāgara nke-ọma; e, anēwu ndi nēme ihe-nmebi-iwu dika ulo; e, ha anwawo Chineke, ewe me ka ha wepuga onwe-ha. 16 Mḅe ahu ndi nātu egwu Jehova nēkwurita okwu, otú onye na ibe-ya: Jehova we ṅa nti, nu, ewe dere ndi nātu egwu Jehova, ndi nēchè kwa èchìchè aha-Ya, akwukwọ ncheta n'iru Ya. 17 Ha gābu kwa nkem, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, n'ubọchi ahu mḅe Mu onwem ganēme ihe, bú ihe nke akam; M'gēnwe kwa ọmiko n'aru ha, dika madu si enwe ọmiko n'aru nwa-ya nke nēfè ya. 18 Unu gālaghachi kwa hu ihe di iche n'etiti onye ezi omume na onye nēmebi iwu, n'etiti onye nēfè Chineke na onye nādighi-efè Ya.

Malakai 4

1 N'ihi na, le, ubọchi ahu nābia, ọ nēre dika ite-ọku uku; ndi-nganga nile na onye ọ bula nke nēme ihe-nmebi-iwu gābu kwa ahihia-ọka: ubọchi ahu nke nābia gērechapu ha, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, ọ gaghi-arapu-kwa-ra ha nkpọrọgwu ma-ọbu alaka. 2 Ma unu ndi nātu egwu aham ka anyanwu nke ezi emume gāwara, ọgwugwọ di kwa na nkù; unu gāpu kwa, wulie elu dika umu-ehi nke ulo ebe anēme ka anu ma abuba. 3 Unu gāzọda kwa ndi nēmebi iwu; n'ihi na ha gābu ntu n'okpuru ọbu-ukwu-unu n'ubọchi ahu mḅe M'gēme ihe, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri. 4 Chetanu iwu Moses, bú orùm, nke M'nyere ya n'iwu na Horeb inye Israel nile, bú ukpuru di iche iche na ikpé di iche iche. 5 Le, Mu onwem nēzitere unu Elaija, bú onye-amuma, tutu oké ubọchi ahu di egwu nke Jehova abia. 6 Ọ gēme kwa ka obi ndi bu nna chigharikute umu-ha, ka obi umu chigharikute kwa ndi bu nna-ha; ka M'we ghara ibia were iwezuga-ka-ebibie-ya tiḅue uwa.

The New Testament of our Lord and Saviour Jesus Christ

Matiu 1

1 Akwukwọ osuso-ọmumu Jisus Kraist, Nwa Devid, nwa Abraham. 2 Abraham muru Aisak; Aisak we mua Jekob; Jekob we mua Juda na umu-nna-ya; 3 Juda we mua Perez na Zera site na Tema; Perez we mua Hezron; Hezron we mua Ram; 4 Ram we mua Aminadab; Aminadab we mua Nahshon; Nahshon we mua Salmon; 5 Salmon we mua Boaz site na Rehab; Boaz we mua Obed site na Rut; Obed we mua Jesi; 6 Jesi we mua Devid, bú eze. Devid we mua Solomon site na nwunye nke Uraia; 7 Solomon we mua Rehoboam; Rehoboam we mua Abaija; Abaija we mua Esa; 8 Esa we mua Jehoshafat; Jehoshafat we mua Joram; Joram we mua Uzaia; 9 Uzaia we mua Jotam; Jotam we mua Ehaz; Ehaz we mua Hezekaia; 10 Hezekaia we mua Manase; Manase we mua Emon; Emon we mua Josaia; 11 Josaia we mua Jekonaia na umu-nne-ya, na mb͕e emere ka ha je biri na Babilon. 12 Mb͕e emesiri ka ha je biri na Babilon, Jekonaia we mua Shealtiel; Shealtiel we mua Zerubabel; 13 Zerubabel we mua Abaiud; Abaiud we mua Elaiakim; Elaiakim we mua Ezoa; 14 Ezoa we mua Sedok; Sedok we mua Akim; Akim we mua Elaiud; 15 Elaiud we mua Eleeza; Eleeza we mua Matan; Matan we mua Jekob; 16 Jekob we mua Josef di Meri, nwanyi nke muru Jisus, Onye anākpọ Kraist. 17 Ya mere ọb͕ọ nile site n'Abraham rue Devid di ọb͕ọ iri na anọ; site na Devid rue mb͕e emere ka ha je biri na Babilon di kwa ọb͕ọ iri na anọ; site na mb͕e emere ka ha je biri na Babilon rue Kraist di kwa ọb͕ọ iri na anọ. 18 Ma ọmumu Jisus Kraist di otú a: Mb͕e ekwereri na Josef gālu nne-Ya Meri, mb͕e ha akēdinakọtaghi, ahuru na ọ di ime site na Mọ Nsọ. 19 Ma Josef di-ya, ebe ọ bu onye ezi omume, ma ọ chọghi igosi ya n'iru ọra, o zubere irapu ya na nzuzo. 20 Ma mb͕e ihe ndia di ya n'obi, le, mọ-ozi nke Chineke were onwe-ya gosi ya na nrọ, si, Josef, nwa Devid, atula egwu ikuru nwunye-gi Meri: n'ihi na Ihe Nke ọ di ime Ya sitere n'aka Mọ Nsọ. 21 Ọ gāmuputa kwa Nwa-nwoke; i gākpọ kwa aha-Ya Jisus, n'ihi na Ya onwe-ya gāzọputa ndi nke Ya na nmehie nile ha. 22 Ma ihe a dum emewo, ka okwu Onye-nwe-ayi kwuru site n'ọnu onye-amuma-Ya we mezu, si, 23 Le, nwa-ab͕ọghọ ahu nāmaghi nwoke gādi ime, ọ gāmuta kwa Nwa-nwoke, Ha gākpọ kwa aha-Ya Immanuel; nke bu, ma asugharia ya, Chineke nọyere ayi. 24 Josef we si n'ura-ya bilie, me dika mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi nyere ya iwu, we kuru nwunye-ya; 25 ọ maghi kwa ya rue mb͕e ọ muputara Nwa-nwoke: o we kpọ aha-Ya Jisus.

Matiu 2

1 Ma mb͕e amuru Jisus na Betlehem nke Judia n'ubọchi Herod, bú eze, le, ufọdu ndi mara ihe, ndi sitere n'Ọwuwa-anyanwu, biaruru Jerusalem, 2 si, Òle ebe Ọ nọ, bú Onye amuru ibu Eze ndi-Ju? n'ihi na ayi huru kpakpando-Ya n'Ọwuwa-anyanwu, ayi we bia ikpọ isi ala nye Ya. 3 Ma mb͕e Herod, bú eze, nuru, obi lọrọ ya miri, ya na Jerusalem nile. 4 O we me ka ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ nile nke ndi-Ju zukọ, o we jua n'ọnu-ha ebe agāmu Kraist nke ha. 5 Ha we si ya, Na Betlehem nke Judia: n'ihi na otú a ka edeworo ya n'akwukwọ site n'aka onye-amuma, si, 6 Gi Betlehem kwa, ala Juda, I dighi nke-ntà kachasia n'etiti ndi-isi Juda ma-ọli: N'ihi na n'etiti gi ka Onye-isi gāputa, Onye gāzù ndi nkem Israel dika aturu. 7 Mb͕e ahu Herod kpọrọ ha na nzuzo, bú ndi ahu mara ihe, o we juta nke-ọma n'ọnu-ha oge kpakpando ahu nke nāputa ìhè. 8 O we zìe ha je Betlehem, si, Ganu chọputa nke-ọma okwu bayere Nwatakiri ahu; ma mb͕e ọ bula unu gāchọta Ya, bia kọrọm, ka mu onwem we je kwa kpọ isi ala nye Ya. 9 Mb͕e ha nuru okwu eze ahu, ha we ga; ma le, kpakpando ahu, nke ha huru n'Ọwuwa-anyanwu, ọ nāga n'iru ha, rue mb͕e ọ biara guzo n'elu ebe Nwatakiri ahu nọ. 10 Mb͕e ha huru kpakpando ahu ha we ṅuria oké ọṅù nke-uku. 11 Ha we ba nime ulo, hu Nwatakiri ahu, Ya na Meri nne-Ya; ha we da n'ala kpọ isi ala nye Ya; ha we kpughe ib͕e àkù ha, che onyinye n'iru Ya, ọla-edo na frankincense na myrrh. 12 Ebe Chineke duru ha ọdú na nrọ ka ha ghara ilaghachi jekuru Herod, ha we wezuga onwe-ha ga ala-ha site n'uzọ ọzọ. 13 Ma mb͕e ha wezugasiri onwe-ha, le, mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi were onwe-ya gosi Josef na nrọ, si, Bilie, kuru Nwatakiri ahu na nne-Ya b͕alaga n'Ijipt, nọ n'ebe ahu rue mb͕e ọ bula m'gāgwa gi: n'ihi na Herod gaje ichọ Nwatakiri ahu ka ọ la Ya n'iyì. 14 O we bilie, kuru Nwatakiri ahu na nne-Ya n'abali, wezuga onwe-ya ga Ijipt; 15 O we nọ n'ebe ahu rue ọnwu Herod: ka okwu Onye-nwe-ayi kwuru site n'ọnu onye-amuma-Ya we mezu, si, Site n'Ijipt ka M'kpọputara Nwam. 16 Mb͕e ahu Herod, mb͕e ọ huru na ndi ahu nke mara ihe mere ya ihe-ọchì, ọnuma di ya n'obi nke-uku, o we ziga, b͕uchasia umuaka-ndikom nile di na Betlehem, na n'ókè-ala-ya nile, site na ndi b͕ara arọ abua we rida, dika oge ahu nke ọ jutara nke-ọma n'ọnu ndi ahu mara ihe. 17 Mb͕e ahu ka emezuru okwu ekwuru site n'ọnu Jeremaia onye-amuma, si, 18 Anuru olu na Rema, Ikwa-ákwá na iru-újú uku, Rechel nākwara umu-ya ákwá; Ọ chọghi kwa ka akasie ya obi, n'ihi na ha adighi. 19 Ma mb͕e Herod nwusiri, le, mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi were onwe-ya gosi Josef na nrọ n'Ijipt, 20 si, Bilie, kuru Nwatakiri ahu na nne-Ya, ga ala Israel: n'ihi na ndi nāchọ ndu Nwatakiri ahu anwuwo. 21 O we bilie, kuru Nwatakiri ahu na nne-Ya, je ala Israel. 22 Ma mb͕e ọ nuru na Akeleọs bu eze Judia n'ọnọdu nna-ya Herod, ọ turu egwu ije ebe ahu; ma ebe Chineke duru ya ọdú na nrọ, o wezugara onwe-ya ga n'akuku Galili, 23 we bia biri n'obodo anākpọ Nazaret: ka okwu ekwuru site n'ọnu ndi-amuma we mezu, na agākpọ Ya Onye Nazaret.

Matiu 3

1 Ma na mb͕e ahu Jọn Baptist biara, nēkwusa n'ọhia nke Judia, 2 si, Chègharianu; n'ihi na ala-eze elu-igwe di nso. 3 N'ihi na nwoke a bu onye ekwuru okwu bayere ya site n'ọnu Aisaia onye-amuma, si, Olu otù onye nēti nkpu n'ọhia, si, Dozienu uzọ Onye-nwe-ayi, Menu okporo-uzọ-Ya ka ha guzozie. 4 Ma Jọn onwe-ya nwere uwe-oyiyi-ya nke aji camel, nēke kwa akpukpọ-ọkiké n'úkwù-ya; nri-ya bu kwa igurube na manu-aṅu nke ọhia. 5 Mb͕e ahu Jerusalem, na Judia nile, na ala nile di Jọdan buruburu, nāpukuru ya; 6 ọ nēme kwa ha baptism n'osimiri Jọdan, ha nēkwuputa nmehie nile ha. 7 Ma mb͕e ọ huru ọtutu madu nime ndi-Farisi na ndi-Sadusi ka ha nābia baptism-ya, ọ siri ha, Unu umu nke aju-ala, ònye gosiri unu ka unu b͕anari iwe gaje ibia? 8 Ya mere, mianu nkpuru kwesiri nchèghari-unu; 9 unu echè-kwa-la ikwu nime onwe-unu, si, Ayi nwere Abraham na nna: n'ihi na asim unu, na Chineke puru ime ka umu tolitere Abraham site na nkume ndia. 10 Ma ọbuná ub͕u a anātukwasi anyu-ike na nkpọrọgwu osisi nile: ya mere anēb͕utu osisi ọ bula nke nāmighi nkpuru ọma, tubà kwa ya nime ọku. 11 Mu onwem nēji miri me unu baptism n'ezie ka unu we chègharia: ma Onye nke nābia n'azum kam ike, Onye m'nērughi ichi akpukpọ-ukwu-Ya: Onye ahu gēji Mọ Nsọ na ọku me unu baptism: 12 Onye ihe-ifucha-ọka-Ya di n'aka-Ya, Ọ gāfuchapu kwa ebe-nzọcha-ọka-Ya nke-ọma, Ọ gēkpokọta kwa ọka-Ya n'ọba-Ya, ma Ọ gēji ọku anāpughi imenyu emenyu rechapu ib͕ob͕o. 13 Mb͕e ahu Jisus siri na Galili bia rue Jọdan jekuru Jọn ahu, ka o we me Ya baptism. 14 Ma Jọn nēb͕ochi Ya, si, Ọ di mu onwem nkpà ka I mem baptism, Gì onwe-gi nābiakutekwam? 15 Ma Jisus zara, si ya, Kwerem ub͕u a: n'ihi na otú a ka ọ kwesiri ayi imezu ezi omume nile. Mb͕e ahu o kwere Ya. 16 Ma mb͕e emere Jisus baptism, ngwa ngwa O si na miri rigota: ma le, emeghere elu-igwe nye Ya, O we hu Mọ nke Chineke ka Ọ nēfeda dika ndùrù, nēbekwasi kwa Ya; 17 ma le, olu sitere n'elu-igwe, si, Onye a bu Ọkparam M'huru n'anya, Onye ihe-Ya dim ezi nma.

Matiu 4

1 Mb͕e ahu Mọ Nsọ duru Jisus rigo n'ọhia ka ekwensu we nwa Ya. 2 Mb͕e O busiri ọnu ọgu ubọchi abua ehihie na abali, emesia agu guru Ya. 3 Onye-ọnwunwa we biakute Ya, si Ya, Ọ buru na I bu Ọkpara Chineke, kwue ka nkume ndia ghọ ob͕e achicha. 4 Ma Ọ zara, si, Edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ọ bughi nání achicha ka madu gēji di ndu, kama ọ bu okwu nile ọ bula nke nēsi n'ọnu Chineke puta. 5 Mb͕e ahu ekwensu kuru Ya bà n'obodo nsọ; o we guzo Ya n'elu akuku ulo uku Chineke, 6 si Ya, Ọ buru na I bu Ọkpara Chineke, tudà Onwe-gi n'ala: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ndi-mọ-ozi-Ya ka Ọ gēnye iwu bayere gi: Ọ bu kwa n'elu aka-ha ka ha gēburu gi, Ka i ghara ikpọbì ukwu-gi na nkume ma eleghi anya. 7 Jisus siri ya, Ọzọ kwa edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Anwala Onye-nwe-ayi Chineke-gi. 8 Ọzọ kwa, ekwensu kuru Ya ga ugwu di oké elu, we gosi Ya ala-eze nile nke uwa, na ebube-ha; 9 o we si Ya, Ihe ndia nile ka m'gēnye Gi, ọ buru na I gādà n'ala kpọ isi ala nyem. 10 Mb͕e ahu Jisus siri ya, Laba, Setan: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye-nwe-ayi Chineke-gi ka i gākpọ isi ala nye, ọ bu kwa nání Ya ka i gēkpere. 11 Mb͕e ahu ekwensu rapu Ya; ma le, ndi-mọ-ozi biakutere Ya nējere Ya ozi. 12 Ma mb͕e Ọ nuru na arara Jọn nye, O wezugara Onwe-ya je Galili; 13 O we rapu Nazaret, bia biri na Kapanaum, nke di n'usọ osimiri, n'ókè-ala Zebulun na Naftali: 14 ka okwu ekwuru site n'ọnu Aisaia onye-amuma we mezu, si, 15 Ala Zebulun na ala Naftali, N'uzọ oké osimiri, n'ofè Jọdan, Galili nke ndi-mba ọzọ, 16 Ndi ahu nke nānọdu n'ọchichiriHuru oké ìhè, Ndi nānọdu kwa n'ala na onyinyo ọnwu, Ndia ka ìhè walitere. 17 Site na mb͕e ahu Jisus malitere ikwusa, na isi, Chègharianu; n'ihi na ala-eze elu-igwe di nso. 18 Ma mb͕e Ọ nējeghari n'usọ oké osimiri Galili, Ọ huru umu-nne abua, Saimon nke anākpọ Pita, na Andru nwa-nne-ya, ka ha nāwuye ub͕u n'oké osimiri; n'ihi na ha bu ndi-ọkù. 19 O we si ha, Bianu som n'azu, M'gēme unu ndi-ọkù nākuta madu. 20 Ngwa ngwa ha we rapu ihe nile ha ji eb͕u azù, so Ya. 21 O we si n'ebe ahu ga, hu umu-nne abua ọzọ, Jemes nwa Zebedi, na Jọn nwa-nne-ya, nime ub͕ọ-ha, ha na nna-ha Zebedi, nēkezi ihe ha ji eb͕u azù; O we kpọ ha. 22 Ngwa ngwa ha we rapu ub͕ọ ahu na nna-ha, so Ya. 23 Jisus we nējeghari na Galili dum, nēzí ihe n'ulo-nzukọ nile ha, nēkwusa kwa ozi ọma nke ala-eze ahu, nāgwọ kwa ọria nile di iche iche na nriaria nile di iche iche n'etiti ndi ahu. 24 Akukọ Ya we jezue na Siria dum: ha we kutara Ya madu nile aru nādighi nma, ndi ọria di iche iche na nmekpa-aru di iche iche nējisi ike, ndi mọ ọjọ ji, ha na ndi ọnwa nēme ka anya ghara idi ha nma, na ndi akuku-aru-ha nwuru anwu; O we me ka aru di ha ike. 25 Ọtutu ìgwè madu we si na Galili na Dekapọlis na Jerusalem na Judia na n'ofè Jọdan so Ya.

Matiu 5

1 Ma mb͕e Ọ huru ìgwè madu ahu, Ọ rigoro n'ugwu ahu: mb͕e Ọ nọduru ala, ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya: 2 O we saghe ọnu-Ya, zí ha ihe, si, 3 Ngọzi nādiri ndi bu ob͕eye nime mọ-ha: n'ihi na ala-eze nke elu-igwe bu nke ndi ahu. 4 Ngọzi nādiri ndi nēru újú: n'ihi na ndi ahu ka agākasì obi. 5 Ngọzi nādiri ndi di nwayọ n'obi: n'ihi na ndi ahu gēketa uwa. 6 Ngọzi nādiri ndi agu ezi omume nāgu, ndi akpiri nākpọ kwa nku na ya: n'ihi na ndi ahu ka afọ gēju. 7 Ngọzi nādiri ndi-ebere: n'ihi na ndi ahu ka agēmere ebere. 8 Ngọzi nādiri ndi di ọcha n'obi: n'ihi na ndi ahu gāhu Chineke. 9 Ngọzi nādiri ndi nēme ka madu na ibe-ha di n'udo: n'ihi na ndi ahu ka agākpọ umu Chineke. 10 Ngọzi nādiri ndi esob͕uworo n'ihi ezi omume: n'ihi na ala-eze elu-igwe bu nke ndi ahu. 11 Ngọzi nādiri unu mb͕e ọ bula ha nāta unu uta, nēsob͕u kwa unu, nēkwu kwa ajọ ihe nile di iche iche megide unu n'okwu-ugha, n'ihim. 12 Ṅurianu ọṅu, ka obi tọ kwa unu utọ nke-uku: n'ihi na ugwọ-ọlu-unu di uku n'elu-igwe: n'ihi na otú a ka ha sob͕uru ndi-amuma ndi buru unu uzọ. 13 Unu onwe-unu bu nnú nke uwa: ma ọ buru na nnú etufuwo utọ-ya, àgēji gini me ya ka ọ ghọ ezi nnú? ọ dighi kwa irè iji me ihe ọ bula ọzọ, ma-ọbughi ka etufue ya n'èzí, madu azọ ya ukwu. 14 Unu onwe-unu bu ìhè nke uwa. Apughi izo obodo nke ewuworo n'elu ugwu. 15 Ma ha adighi-amuye oriọna, dọba ya n'okpuru mb͕é, kama n'elu ihe-idọba-oriọna; ọ nēnwu-kwa-ra madu nile nọ n'ulo ahu. 16 Otú a menu ka ìhè-unu nēnwu n'iru madu, ka ha we hu ọlu ọma nile unu, we to Nna-unu Nke bi n'elu-igwe. 17 Unu echèla na abiaram imebi iwu Chineke ma-ọbu ndi-amuma-Ya: abiaghm imebi, kama imezu ya. 18 N'ihi na n'ezie asim unu, Rue mb͕e elu-igwe na ala gāgabiga, ọ dighi otù ihe ọ bula dikarisiri ntà gāgabiga n'iwu ma-ọli, rue mb͕e ihe nile gēme. 19 Ya mere onye ọ bula nke gēmebi otù nime ihe ndia dikarisiri ntà nke enyere n'iwu, nke gēzí kwa madu otú ahu, agākpọ ya onye dikarisiri ntà n'ala-eze elu-igwe: ma onye ọ bula nke gēme ha, zí kwa ha, onye ahu ka agākpọ onye uku n'ala-eze elu-igwe. 20 N'ihi na asim unu, na ọ buru na ezi omume-unu adighi-akari ezi omume ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi nke-uku, unu agaghi-abà n'ala-eze elu-igwe ma-ọli. 21 Unu nuru na agwara ndi-ochie, si, Eb͕ula madu; ma onye ọ bula nke b͕uru madu gēnye onwe-ya n'aka ikpé: 22 ma Mu onwem si unu, na onye ọ bula nke nēwe iwe megide nwa-nne-ya gēnye onwe-ya n'aka ikpé; onye ọ bula nke gāsi kwa nwa-nne-ya, Raka, gēnye onwe-ya n'aka nnọkọ-ikpé; onye ọ bula nke gāsi kwa, Onye-nzuzù, gēnye onwe-ya n'aka ọku ala-mọ. 23 Ya mere ọ buru na i nēche onyinye-gi n'iru Chineke n'ebe-ichu-àjà, i we cheta n'ebe ahu na nwa-nne-gi nwere ihe megide gi, 24 rapu onyinye-gi n'ebe ahu n'iru ebe-ichu-àjà, laba, buru uzọ me ka gi na nwa-nne-gi di n'udo, mb͕e ahu bia kwa che onyinye-gi. 25 Me ka gi na onye nēkuru gi ga ikpé me eyì ọsọsọ, mb͕e gi na ya nọ n'uzọ; ka onye ahu nēkuru gi ga ikpe we ghara irara gi nye n'aka onye-ikpe ma eleghi anya, onye ikpe arara kwa gi nye n'aka onye nēje ozi, ewe tubà gi n'ulo-nkpọrọ. 26 N'ezie asim i, I gaghi-aputa n'ebe ahu ma-ọli, rue mb͕e i gākwughachi farthing ikpe-azu. 27 Unu nuru na ekwuru, si, Akwala iko: 28 ma Mu onwem si unu, na nwoke ọ bula nke nēle nwanyi anya ka agu ya we gua ya, ọ kwasiwo ya iko n'obi-ya ub͕u a. 29 Ma ọ buru na anya aka-nri gi eme gi ka i ma n'ọnyà, ghupu ya, tupu kwa ya n'aru-gi: n'ihi na ọ bara gi urù ka otù nime ihe di gi n'aru la n'iyì, ka aghara kwa itubà aru-gi dum n'ọku ala-mọ. 30 Ma ọ buru na aka-nri-gi eme gi ka i ma n'ọnya, bipu ya, tupu kwa ya n'aru-gi: n'ihi na ọ bara gi urù ka otù nime ihe di gi n'aru la n'iyì, ka aru-gi dum ghara kwa ije n'ọku ala-mọ. 31 Ekwu-kwa-ra, si, Nwoke ọ bula nke gārapu nwunye-ya, ya nye ya akwukwọ nkewa: 32 ma Mu onwem si unu, na nwoke ọ bula nke nārapu nwunye-ya, ma-ọbughi n'ihi ikwa-iko, ọ nēme nwanyi ahu ka ọ nọ n'ọnọdu onye akwara iko megide: onye ọ bula nke gālu kwa ya mb͕e arapusiri ya, ọ nākwa iko. 33 Ọzọ kwa, unu nuru na agwara ndi-ochie, si, Aṅula iyí ugha, kama nyeghachi Onye-nwe-ayi ihe nile i ṅuru n'iyí: 34 ma Mu onwem si unu, Aṅula iyí ma-ọli; ejila elu-igwe ṅu, n'ihi na ọ bu oche-eze Chineke; 35 eji-kwa-la ala, n'ihi na ọ bu ihe-nb͕akwasi-ukwu nke ukwu-Ya; aṅukwala iyí n'ebe Jerusalem di, n'ihi na ọ bu obodo nke Eze uku ahu. 36 Eji-kwa-la isi-gi ṅu iyí, n'ihi na i pughi ime otù agiri-isi ka ọ di ọcha ma-ọbu ka ọ di oji. 37 Ma ka okwu-unu buru, E, e; É-è, é-è: ma ihe ọ bula kariri ndia nēsite n'ajọ onye ahu. 38 Unu nuru na ekwuru, si, Anya lara anya, ezé lara ezé: 39 ma Mu onwem si unu, Eguzogidela onye bu ajọ onye: kama onye ọ bula nāku gi ura na ǹtì aka-nri, tughari-kwa-ra ya ǹtì ọzọ. 40 Ma ọ buru na onye ọ bula nāchọ ka gi na ya je ikpé, ka o we nara gi uwe-ime-gi, rapu-kwa-ra ya oké uwe-gi. 41 Onye ọ bula nke gējide gi ije otù mile, so ya je mile abua. 42 Nye onye nāriọ gi, ab͕akuta-kwa-la ya azú, bú onye nāchọ ka i binye ya ihe. 43 Unu nuru na ekwuru, si, Hu madu-ibe-gi n'anya, kpọ kwa onye-iro-gi asì: 44 ma Mu onwem si unu, Nāhunu ndi-iro-unu n'anya, nēkpe kwa ekpere nye ndi nēsob͕u unu; 45 ka unu we buru umu nke Nna-unu Nke bi n'elu-igwe: n'ihi na Ọ nēme ka anyanwu-Ya nāwakwasi ajọ madu na ezi madu, Ọ nēme kwa ka miri zokwasi ndi ezi omume na ndi ajọ omume. 46 N'ihi na ùnu nwere ugwọ-ọlu gini, ma ọ buru na unu huru ndi ahu n'anya, bú ndi nāhu unu n'anya? ọbuná ndi-ọna-utu, hà adighi-eme otù ihe ahu? 47 Ọ buru kwa na unu nēkele nání umu-nne-unu, gini ka unu nēme kari ndi ọzọ? ọbuná ndi mba ọzọ, hà adighi-eme otù ihe ahu? 48 Ya mere unu onwe-unu gēzu okè, dika Nna-unu nke elu-igwe zuru okè.

Matiu 6

1 Lezienu anya ka unu ghara ime ezi omume-unu n'iru madu, ka ha we kiri unu: ma unu emeghi otú a unu enweghi ugwọ-ọlu n'ebe Nna-unu Nke bi n'elu-igwe nọ. 2 Ya mere, mb͕e ọ bula i nālu ọlu ebere, afùla opì n'iru gi, ọbuná dika ndi-iru-abua nēme n'ulo-nzukọ-unu na n'uzọ-unu, ka ha we nara otuto n'aka madu. N'ezie asim unu, Ha nēnwezu ugwọ-ọlu-ha. 3 Ma mb͕e i nālu ọlu ebere, ka aka-ekpe-gi ghara ima ihe aka-nri-gi nēme: 4 ka ọlu ebere gi we di na nzuzo: Nna-gi Nke nāhu ihe na nzuzo gēnyeghachi kwa gi. 5 Mb͕e ọ bula unu nēkpe kwa ekpere, unu agaghi-adi ka ndi-iru-abua ahu: n'ihi na ọ nātọ ha utọ iguzo n'ulo-nzukọ-unu na nkuku amá-unu ikpe ekpere, ka ha we were onwe-ha gosi madu. N'ezie asim unu, Ha nēnwezu ugwọ-ọlu-ha. 6 Ma gi onwe-gi, mb͕e ọ bula i nēkpe ekpere, bà n'ime-ulo ntà gi, mb͕e i mechisi-kwa-ra uzọ-gi, kpere Nna-gi Nke di na nzuzo, Nna-gi Nke nāhu ihe na nzuzo gēnyeghachi kwa gi. 7 Ma mb͕e unu nēkpe ekpere, unu ekwula okwu-nkwukwasi efù, dika ndi mba ọzọ nēme: n'ihi na ha nēchè na agānu olu-ha n'ọtutu okwu ha nēkwu. 8 Ya mere, unu eyila ha: n'ihi na Nna-unu matara ihe nile di unu nkpà, mb͕e unu akāriọghi Ya. 9 Ya mere, kpenu ekpere otú a: Nna-ayi Nke bi n'elu-igwe, Ka edo aha-Gi nsọ. 10 Ka ala-eze-Gi bia. Ka eme ihe nāchọ, dika esi eme ya n'elu-igwe, ka eme kwa otú ahu n'uwa. 11 Nye ayi nri ta nke gēzuru ayi n'ubọchi ta. 12 B͕aghara kwa ayi ugwọ nile ayi ji, dika ayi onwe-ayi b͕agharawo-kwa-ra ndi ji ayi ugwọ. 13 Ewebàla ayi nime ọnwunwa, kama dọputa ayi n'aka ajọ onye ahu. 14 N'ihi na ọ buru na unu ab͕aghara madu ndahie nile ha, Nna-unu gāb͕aghara kwa unu. 15 Ma ọ buru na unu ab͕agharaghi madu ndahie nile ha, Nna-unu agaghi-ab͕aghara unu ndahie-unu. 16 Ọzọ, mb͕e ọ bula unu nēbu ọnu, unu aghọla ndi nāb͕aru iru, dika ndi-iru-abua: n'ihi na ha nēmebi iru-ha, ka ha were onwe-ha gosi madu na ha nēbu ọnu. N'ezie asim unu, Ha nēnwezu ugwọ-ọlu-ha. 17 Ma gi onwe-gi, mb͕e i nēbu ọnu, were manu te n'isi-gi, sa kwa iru-gi; 18 ka i ghara igosi madu onwe-gi na i nēbu ọnu, kama gosi Nna-gi Nke di na nzuzo: Nna-gi, Nke nāhu ihe na nzuzo, gēnyeghachi kwa gi. 19 Unu akpadola àkù n'uwa nye onwe-unu, ebe nla na nchala nērichapu, ebe ndi-ori nēgwupú kwa nēzu kwa ori: 20 kama kpadonu àkù n'elu-igwe nye onwe-unu, ebe nla ma-ọbu nchala nādighi-erichapu, ebe ndi-ori nādighi-egwupú kwa, ha adighi-ezu kwa ori: 21 n'ihi na ebe àkù-gi di, n'ebe ahu ka obi-gi gādi kwa. 22 Oriọna nke aru bu anya: ya mere ọ buru na anya-gi ele otù ebe, aru-gi dum gējuputa n'ìhè. 23 Ma ọ buru na anya-gi jọrọ njọ, aru-gi dum gējuputa n'ọchichiri. Ya mere, ọ buru na ìhè nke di nime gi bu ọchichiri, le ka ọchichiri ahu si di oké ibù! 24 Ọ dighi onye ọ bula puru ibu orù nke nna abua: n'ihi na ọ gākpọ otù onye nime ha asì, hu ibe-ya n'anya; ma ọ bughi otú a ọ gējide otù, lelìa ibe-ya anya. Unu apughi ibu orù Chineke na àkù. 25 N'ihi nka ka M'ji si unu, Unu echeb͕ula onwe-unu nye ndu-unu, ihe unu gēri, ma-ọbu ihe unu gāṅu; echeb͕u-kwa-la onwe-unu nye aru-unu, ihe unu gēyi. Ọ̀ bughi ndu kariri ihe eji azù ya, ọ̀ bughi kwa aru kariri uwe-oyiyi-ya? 26 Lenu anu-ufe nke elu-igwe, na ha adighi-agha nkpuru, ha adighi-ewè kwa ihe-ubi, ha adighi-ekpokọta kwa ihe ba n'ọba; ma Nna-unu nke elu-igwe nāzù ha. Ùnu onwe-unu abughi ihe oké ọnu-ahia kari ha? 27 Ma ònye n'etiti unu puru itukwasi otù cubit n'ogologo-ya site n'icheb͕u onwe-ya? 28 Gini mere unu nēcheb͕u kwa onwe-unu nye uwe-oyiyi? Ribanu urodi nke ubi ámá, otú ha nētó etó; ha adọb͕ughi onwe-ha n'ọlu, ha atughi kwa ogho: 29 ma asim unu, na ọbuná Solomon n'ebube-ya nile, eb͕okwasighi ya ákwà dika otù nime ndia. 30 Ma ọ buru na Chineke eyikwasi ahihia nke ubi uwe otú a, nke di ta, echi atubà ya n'ite ọku, Ọ̀ gaghi-eyikwasi kari unu uwe nke-uku, unu ndi okwukwe ntà? 31 Ya mere, unu echeb͕ula onwe-unu, si, Gini ka ayi gēri? ma-ọbu, Gini ka ayi gāṅu? ma-ọbu, Gini ka agēji b͕okwasi ayi? 32 N'ihi na ihe ndia nile ka ndi mba ọzọ nāchọ; n'ihi na Nna-unu nke elu-igwe nāmata na ihe ndia nile di unu nkpà. 33 Ma burunu uzọ chọ ala-eze-Ya, na ezi omume-Ya; agātukwasi-kwa-ra unu ihe ndia nile. 34 Ya mere, unu echeb͕ula onwe-unu nye echi: n'ihi na echi gēcheb͕uru onwe-ya. Ihe ọjọ nke ubọchi ta ezuworo ya.

Matiu 7

1 Unu ekpela ikpé, ka aghara ikpe unu ikpé. 2 N'ihi na ikpé unu ji kpe ka agēji kpe unu: ọ bu kwa ihe unu ji tù ihe ka agēji tùru unu. 3 Ma gini mere i ji le irighiri ahihia nke di n'anya nwa-nna-gi, ma i tugharighi uche na ntuhie nke di n'anya nke gi? 4 Ma-ọbu ì gēsi aṅa si nwa-nna-gi, Kwe ka m'tupu irighiri ahihia ahu n'anya-gi: ma le, ntuhie ahu di n'anya nke gi? 5 Onye-iru-abua, buru uzọ tupu ntuhie ahu n'anya nke gi; mb͕e ahu ka i gēlegide anya itupu irighiri ahihia ahu n'anya nwa-nna-gi. 6 Unu enyela nkita ihe di nsọ, unu atuda-kwa-la pearl-unu n'iru ezì, ka ha ghara izọkwasi ha n'ukwu-ha ma eleghi anya, we chigharia, dọka unu. 7 Riọnu, agēnye kwa unu; chọnu, unu gāchọta kwa; kuanu, agēmeghe-kwa-ra unu: 8 n'ihi na onye ọ bula nke nāriọ nāriọta; onye nāchọ kwa nāchọta; onye nāku kwa ka agēmeghere. 9 Ma -ọbu òle madu di n'etiti unu, onye, ma ọ buru na nwa-ya gāriọ ya ob͕e achicha, gēnye ya nkume; 10 ma-ọbu asi na ọ gāriọ azù, gēnye ya agwọ? 11 Ya mere, ọ buru na unu onwe unu, ọ bu ezie na unu jọrọ njọ, ma unu nāmata inye umu-unu ezi onyinye, Nnà-unu Nke bi n'elu-igwe gēsi aṅa ghara iwere kari ezi ihe nke-uku nye ndi nāriọ Ya? 12 Ya mere ihe nile, ka ha ra, bú nke unu nāchọ ka madu nēme unu, nēme-kwa-nu madu otú a, unu onwe-unu: n'ihi na nka bu iwu na ndi-amuma Chineke. 13 Sinu n'ọnu-uzọ di warara bà: n'ihi na obosara ka ọnu-uzọ ahu di, mbara ka uzọ ahu di kwa, nke nēdubà n'ila-n'iyì, ọtutu ka ha di kwa, bú ndi nēsi na ya nābà. 14 N'ihi na warara ka ọnu-uzọ ahu di, nkpagide ka uzọ ahu di kwa, nke nēdubà na ndu, ole-na-ole ka ha di kwa, bú ndi nāchọta ya. 15 Nēzenu ndi-amuma ugha, ndi nābiakute unu n'ihe-oyiyi aturu, ma n'ime ha bu agu nāpunara aturu. 16 Unu gēsite na nkpuru-ha mazu ha. Màdu nēkpokọputa nkpuru-vine n'ogwu, ma-obu fig n'uké? 17 Otú a ezi osisi ọ bula nāmi nkpuru ọma; ma osisi nābaghi n'ihe nāmi ajọ nkpuru. 18 Ezi osisi apughi imi ajọ nkpuru, osisi nābaghi n'ihe apughi kwa imi nkpuru ọma. 19 Anēb͕utu osisi ọ bula nke nāmighi nkpuru ọma, tubà kwa ya nime ọku. 20 Ya mere unu gēsite na nkpuru-ha mazu ha. 21 Ọ bughi onye ọ bula nke nāsim, Onye-nwe-ayi, Onye-nwe-ayi, gābà n'ala eze elu-igwe; kama ọ bu onye nēme ihe Nnam Nke bi n'elu-igwe nāchọ. 22 Ọtutu madu gāsim n'ubọchi ahu, Onye-nwe-ayi, Onye-nwe-ayi, àyi jiri aha-Gi bu amuma, àyi jiri kwa aha-Gi chupu ndi-mọ ọjọ, àyi jiri kwa aha-Gi lu ọtutu ọlu di ike? 23 Ma mb͕e ahu ka M'gēkwuputara ha, si, Ọ dighi mb͕e ọ bula M'mara unu: si n'ebe M'nọ pua, unu ndi nālu ọlu nēmebi iwu. 24 Ya mere onye ọ bula nke nānu okwum ndia, nēme kwa ha, agēji ya tuyere nwoke nwere uche, onye wuru ulo-ya n'elu oké nkume: 25 miri we zo, osimiri ru kwa, ifufe fe kwa, we makwasi ulo ahu; ma ọ dagh: n'ihi na atọrọ ntọ-ala-ya n'elu oké nkume ahu. 26 Ma onye ọ bula nke nānu okwum ndia, ma ọ dighi-eme ha, agēji ya tuyere nwoke nke bu onye-nzuzu, onye wuru ulo-ya n'elu ájá: 27 miri we zo, osimiri ru kwa, ifufe fe kwa, we tikwasi ulo ahu; o we da: ọdida-ya di kwa uku. 28 O rue, mb͕e Jisus kwubìri okwu ndia, ibobo ozizí-Ya nwuru ìgwè madu nile n'aru: 29 n'ihi na Ọ nēzí ha ihe dika O nwere ike ọ bughi kwa dika ndi-ode-akwukwọ-ha.

Matiu 8

1 Ma ka O siri n'ugwu ahu ridata, oké ìgwè madu soro Ya. 2 Ma le, onye-ekpenta biakutere Ya. nākpọ isi ala nye Ya, si, Onye-nwe-ayi, ọ buru na I nāchọ, I puru ime ka m'di ọcha. 3 O we setipu aka-Ya, metu ya, si, Anamachọ; ka eme ka i di ọcha. Ngwa ngwa ewe me ka ọ di ọcha n'ekpenta-ya. 4 Jisus we si ya, Lezi anya ka i ghara igwa onye ọ bula okwu; ma laba, were onwe-gi gosi onye-nchu-àjà, che kwa n'iru Chineke onyinye ahu Moses nyere n'iwu, ka ọ buru ha àmà. 5 Mb͕e Ọ batara na Kapanaum, otù ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise biakutere Ya, nāriọ Ya, 6 si, Onye-nwe-ayi, onye nējerem ozi tọb͕ọrọ n'ulom, akuku-aru-ya nwuru anwu, anēmekpa ya aru gabiga ókè. 7 O we si ya, Mu onwem gābia me ka aru di ya ike. 8 Ma ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise zara, si, Onye-nwe-ayi, erughm ka I ba n'okpuru ulom: kama were nání okwu-ọnu kwue, agēme kwa ka aru onye nējerem ozi di ike. 9 N'ihi na mu onwem bu kwa onye nọ n'okpuru ike, nēnwe ndi-agha n'okpuru mu onwem: m'we si onye a, Ga, ọ ga; m'si kwa onye ọzọ, Bia, ọ bia; m'si kwa orùm, Me nka, o me ya. 10 Ma mb͕e Jisus nuru nka, o juru Ya anya, Ọ, we si ndi n'eso ya n'azu, N'ezie asim unu, Ọ dighi mb͕e M'huru oké okwukwe di otú a n'aru onye ọ bula n'Israel. 11 Ma asim unu, na ọtutu madu gēsi n'Ọwuwa-anyanwu na Ọdida-anyanwu bia, so kwa Abraham, na Aisak, na Jekob, nānọdu n'ala-eze elu-igwe: 12 ma agāchupu umu ala-eze ahu bà n'ọchichiri nke èzí: n'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi. 13 Jisus we si ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise, Laba; dika i kwere, ka emere gi. Ewe me ka aru onye nējere ya ozi di ike n'oge hour ahu. 14 Mb͕e Jisus batasiri n'ulo Pita, O we hu nne nwunye-ya ka ọ tọb͕ọrọ n'aru-ọku. 15 O we metu aka-ya, aru-ọku ahu we rapu ya; o we bilie, nēje-kwa-ra Ya ozi. 16 Ma mb͕e o ruru anyasi, ha kutara Ya ọtutu madu ndi mọ ọjọ ji: O we were okwu-ọnu chupu ndi-mọ ahu, me kwa ndi nile aru nādighi nma ka aru-ha di ike: 17 ka okwu ekwuru site n'ọnu Aisaia onye-amuma we mezu, si, Ya onwe-ya nara nriaria nile ayi, būru kwa ọria nile ayi. 18 Ma mb͕e Jisus huru na ọtutu ìgwè madu di Ya buruburu, O kwuru ka ha gabiga n'ofè ọzọ. 19 Otù ode-akwukwọ we biakute Ya, si Ya, Onye-ozizí, m'gēso Gi ebe ọ bula I nēje. 20 Jisus we si ya, Nkita-ọhia nwere ọnu ha nēdina, anu-ufe nke elu-igwe nwe-kwa-ra ebe ha nāraru ura; ma Nwa nke madu enweghi ebe itọb͕ọ isi-Ya. 21 Onye ọzọ n'etiti ndi nēso uzọ-Ya we si Ya, Onye-nwe-ayi, kwe ka m'buru uzọ je lìe nnam. 22 Ma Jisus si ya, Som; rapu kwa ndi nwuru anwu ka ha lìe ndi nke ha ndi nwuru anwu. 23 Mb͕e Ọ batara n'ub͕ọ, ndi nēso uzọ-Ya we so Ya. 24 Ma le, oké ajọ ifufe febe n'oké osimiri, ya mere ebili-miri nēkpuchi ub͕ọ-ha: ma Ya onwe-ya nāraru ura. 25 Ha we biakute Ya, kpọte Ya, si, Onye-nwe-ayi, zọputa ayi; ayi nāla n'iyì. 26 O we si ha, Gini mere unu nātu ujọ, unu ndi okwukwe ntà? Mb͕e ahu O biliri, bara ifufe na oké osimiri ahu nba; oké ndaju we di. 27 Ibobo we nwua ndi ahu n'aru, ha si, Àha madu gini ka Onye a bu, na ọbuná ifufe na oké osimiri nāṅa Ya nti? 28 Mb͕e Ọ gabigasiri n'ofè ọzọ n'ala ndi Gadara, ndikom abua ndi mọ ọjọ ji we zute Ya, ndi nēsi n'ebe anēlì ozu puta, ndi anya-ha di oké egwu, ya mere ọ dighi onye ọ bula nwere ike igabiga uzọ ahu. 29 Ma le, ha tiri nkpu, si, Gini ka ayi na Gi nwekọrọ, Gi Ọkpara Chineke? Ì biara ebe a imekpa ayi aru mb͕e oge-ayi akērughi? 30 Ma ìgwè nke ọtutu ezì di n'ebe di anya n'ebe ha nọ, nāta nri. 31 Ndi-mọ ọjọ ahu we riọ Ya, si, Ọ buru na I chupuru ayi, ziga ayi nime ìgwè ezì ahu. 32 O we si ha, Labanu. Ha we puta, je ba n'ìgwè ezì ahu: ma le, ìgwè ezì ahu nile nudara n'ebe ahu di nkputankpu dabà n'oké osimiri, nwua nime miri. 33 Ndi nāzù ha we b͕alaga, we je ba n'obodo ahu, kọsa ihe nile, ya na ihe mere ndi ahu ndi-mọ ọjọ ji. 34 Ma le, obodo ahu nile putara izute Jisus: ma mb͕e ha huru Ya, ha riọrọ Ya ka Ọ pua n'ókè-ala-ha.

Matiu 9

1 O we ba nime ub͕ọ, gabiga n'ofè ọzọ, bia n'obodo nke aka Ya. 2 Ma le, ha butere Ya onye akuku-aru-ya nwuru anwu, tọb͕ọrọ n'ihe-ndina: mb͕e Jisus huru okwukwe-ha Ọ si onye ahu akuku-aru-ya nwuru anwu, Nwa, nwe obi-ike; anāb͕aghara gi nmehie-gi nile. 3 Ma le, ufọdu n'etiti ndi-ode-akwukwọ kwuru nime onwe-ha, si, Nwoke a nēkwulu Chineke. 4 Ma Jisus, ebe ọ mara ihe nile di ha n'obi, Ọ si, Gini mere unu nēchè ajọ ihe n'obi-unu? 5 N'ihi na, òle nke ka nfe, isi, Anāb͕aghara gi nmehie-gi nile; ma-ọbu isi, Bilie, jeghari kwa? 6 Ma ka unu we mata na Nwa nke madu nwere ike n'elu uwa ib͕aghara nmehie (mb͕e ahu Ọ siri onye ahu ukwu-ya nwuru anwu), Bilie, chiri ihe-ndina-gi, la n'ulo-gi. 7 O we bilie, la n'ulo-ya. 8 Ma mb͕e ìgwè madu nile huru ya, ha turu egwu, we nye Chineke otuto, Onye nyere madu ike di otú a. 9 Mb͕e Jisus nēsi n'ebe ahu nāga, Ọ huru otù nwoke, anākpọ Matiu, ka ọ nọduru n'ulo-ùtú: Ọ si ya, Som. O we bilie, so Ya. 10 O rue, mb͕e Ọ nọduru na nri n'ulo-ya, le, ọtutu ndi-ọna-utu na ndi-nmehie biara so Jisus na ndi nēso uzọ-Ya nọdu na nri. 11 Mb͕e ndi-Farisi huru ya, ha we si ndi nēso uzọ-Ya, N'ìhi gini ka Onye-ozizí-unu nēso ndi-ọna-utu na ndi-nmehie ndia eri ihe? 12 Ma mb͕e Ọ nuru ya, Ọ si, Nkpà dibia akpaghi ndi di ike, kama ọ nākpà ndi aru nādighi nma. 13 Ma ganu muta ihe okwu a bu, Anamachọ ebere, ọ bughi àjà: n'ihi na abiaghm ikpọ ndi ezi omume, kama ọ bu ndi-nmehie. 14 Mb͕e ahu ndi nēso uzọ Jọn biakutere Ya, si, N'ìhi gini ka ayi onwe-ayi na ndi-Farisi nēbu ọnu ọtutu mb͕e, ma ndi nēso uzọ-Gi adighi-ebu ọnu? 15 Jisus we si ha, Umu-ndikom nke ulo anālu nwunye ọhu, ọ̀ gābu na ha puru iru újú ka oge ahu ra, bú mb͕e ha na Onye nālu nwunye ọhu nānọ? ma ubọchi gābia, mb͕e agānapu ha Onye nālu nwunye ọhu, mb͕e ahu ka ha gēbu kwa ọnu. 16 Ọ dighi kwa onye ọ bula nēwere iberibe ákwà ọb͕ub͕a ọhu tukwasi n'uwe ochie; n'ihi na nke kwesiri ímechi ya nādọkapu ihe n'aru uwe ahu, ndọka jọkariri njọ aputa. 17 Ha adighi-ab͕aye kwa manya-vine ọhu na karama-akpukpọ ochie: eme otú a, karama-akpukpọ ahu ab͕awa, manya-vine ahu we wusì, karama-akpukpọ ahu ala kwa n'iyì: ma ha nāb͕aye manya-vine ọhu na karama-akpukpọ ọhu, anēdebe ha abua nke-ọma. 18 Mb͕e Ọ nāgwa ha okwu ndia, le, otù onye-isi biara, we kpọ isi ala nye Ya, si, Nwam nwayi anwuruwo ọbuná ub͕u a: otú ọ di, bia bikwasi ya aka-Gi, na ọ gādi ndu. 19 Jisus we bilie, so ya je, ndi nēso uzọ-Ya so-kwa-ra. 20 Ma le, otù nwanyi, nke nwere orùrù-ọbara arọ iri na abua, biara n'azu Ya, we metu ọnu-ọnu uwe-Ya aka: 21 n'ihi na ọ nāsi n'onwe-ya, Ọ buru na emetum nání uwe-Ya aka, agāzọputam. 22 Ma Jisus chighariri, we hu ya, si, Nwam nwanyi, nwe obi-ike; okwukwe-gi azọputawo gi. Ewe site n'oge hour ahu zọputa nwanyi ahu. 23 Mb͕e Jisus biara n'ulo onye-isi ahu, hu ndi-ọkwa-ọ̀jà, na ìgwè madu ka ha nātu ùzù, 24 Ọ si, Wezuganu onwe-unu; n'ihi na nwa-ab͕ọghọ ntà ahu anwughi anwu, kama ọ nāraru ura. Ha we chìa Ya ọchì. 25 Ma mb͕e achupuru ìgwè madu ahu, Ọ ba nime, jide ya n'aka; nwa-ab͕ọghọ ntà ahu we bilie. 26 Ùdé a we pua gazue n'ala ahu dum. 27 Mb͕e Jisus nēsi n'ebe ahu nāga, ndi-ìsì abua we so Ya, nēti nkpu, si, Mere ayi ebere, Nwa Devid. 28 Ma mb͕e Ọ batasiri n'ulo, ndi-ìsì ahu biakutere Ya: Jisus we si ha, Ùnu kwere na apurum ime ihe a? Ha si Ya, E, Onye-nwe-ayi. 29 Mb͕e ahu O meturu anya-ha aka, si, Dika okwukwe-unu si di ka emere unu. 30 Ewe saghe anya-ha. Jisus we dọ ha aka na nti nke-uku, si, Lezienu anya ka onye ọ bula ghara ima ya. 31 Ma ha puru, b͕asa ùdé-Ya n'ala ahu dum. 32 Mb͕e ha nāpu, le, ekutara Ya onye-ob͕i nke mọ ọjọ ji. 33 Mb͕e achupusiri mọ ọjọ ahu, onye-ob͕i ahu we kwue okwu: ibobo we nwua ìgwè madu nile n'aru, ha si, Ọ dighi mb͕e ọ bula egosiri ya otú a n'Israel. 34 Ma ndi-Farisi nāsi, N'ike onye-isi ndi-mọ ọjọ ka Ọ nāchupu ndi-mọ ọjọ. 35 Jisus we nējeghari n'obodo na obodo ntà ha nile, nēzí ihe n'ulo-nzukọ nile ha, nēkwusa kwa ozi ọma nke ala-eze ahu, nāgwọ kwa ọria nile di iche iche na nriaria nile di iche iche. 36 Ma mb͕e Ọ huru ìgwè madu nile, O nwere ọmiko n'aru ha, n'ihi na anēsob͕u ha, nāchusa kwa ha, dika aturu nēnweghi onye nāzù ha. 37 Mb͕e ahu Ọ si ndi nēso uzọ-Ya, Owuwe-ihe-ubi riri nne n'ezie, ma ndi-ọlu di ole-na-ole. 38 Ya mere, nāriọnu Onye-nwe owuwe-ihe-ubi ahu, ka O zipu ndi-ọlu bà n'owuwe-ihe-ubi-Ya.

Matiu 10

1 O we kpọ ndikom iri na abua ahu ndi nēso uzọ-Ya ka ha biakute Ya, O nye ha ike n'ebe ndi-mọ nādighi ọcha nọ, ichupu ha, na igwọ ọria nile di iche iche na nriaria nile di iche iche. 2 Ma aha ndi-ozi iri na abua ahu bu ndia: Onye mbu, Saimon, onye anākpọ Pita, na Andru nwa-nne-ya; na Jemes nwa Zebedi, na Jọn nwa-nne-ya; 3 Filip, na Batọlọmiu; Tomas, na Matiu onye-ọna-utu; Jemes nwa Alfiọs, na Tadiọs; 4 Saimon Kananiọs, na Judas Iskariot, onye ra-kwa-ra Ya nye. 5 Ndikom iri na abua ahu ka Jisus zipuru, O we nye ha iwu, si, Unu ejela n'uzọ ndi mba ọzọ, unu abà-kwa-la n'obodo ndi Sameria: 6 kama jekurunu aturu furu efu nke ulo Israel. 7 Mb͕e unu nāga, nēkwusanu, si, Ala-eze elu-igwe di nso. 8 Menu ndi aru-ha nādighi ike ka aru di ha ike, menu ndi nwuru anwu ka ha si n'ọnwu bilie, menu ndi-ekpenta ka ha di ọcha, chupunu ndi-mọ ọjọ: n'efu ka unu natara, nyenu n'efu. 9 Unu anatala ọla-edo, ma-ọbu ọla-ọcha, ma-ọbu ọla itiye n'ihe-ọkiké-unu; 10 unu anatala àkpà iwere ga ije-unu, ma-ọbu uwe-ime abua, ma-ọbu akpukpọ-ukwu, ma-ọbu nkpa-n'aka: n'ihi na onye-ọlu kwesiri ihe eji azù ya. 11 Ma obodo ọ bula ma-ọbu obodo ntà ọ bula unu gābà nime ya, chọputanu onye kwesiri nime ya; nọgidenu n'ebe ahu rue mb͕e unu putara. 12 Mb͕e unu nābà n'ulo ahu, kelenu ya. 13 Ọ buru kwa na ulo ahu kwesiri, ka udo-unu biakwasi ya: ma ọ buru na o kwesighi, ka udo-unu laghachikute unu ọzọ. 14 Ma onye ọ bula nke nānaraghi unu nke-ọma, nke nānughi kwa okwu nile unu, mb͕e unu nāpu n'ulo ahu ma-ọbu n'obodo ahu, tichapu ájá ukwu-unu. 15 N'ezie asim unu, Ala Sọdọm na Gọmọra gānagide okwu n'ubọchi ikpé kari obodo ahu. 16 Le, Mu onwem nēzipu unu dika aturu n'etiti agu: ya mere, burunu ndi nwere uche dika agwọ, ndi nādighi kwa aghughọ dika nduru. 17 Ma nēzenu madu: N'ihi na ha gārara unu nye n'aka nnọkọ-ikpé di iche iche, n'ulo-nzukọ nile ha ka ha gāpia kwa unu ihe; 18 e, n'iru ndi-isi na ndi-eze ka agēkuru kwa unu je n'ihim, iburu ha na ndi mba ọzọ àmà. 19 Ma mb͕e ọ bula ha gārara unu nye, unu echeb͕ula onwe-unu otú unu gēkwu ma-ọbu okwu unu gēkwu: n'ihi na agēnye unu n'oge hour ahu okwu unu gēkwu. 20 N'ihi na ọ bughi unu onwe-unu nēkwu, kama ọ bu Mọ nke Nna-unu Nke nēkwu nime unu. 21 Nwa-nne gārara kwa nwa-nne-ya nye n'ọnwu, nna gārara kwa nwa-ya nye: umu gēbili kwa megide ndi muru ha, me ka ha nwua anwu. 22 Madu nile gākpọ kwa unu asì n'ihi aham: ma onye were ntachi-obi nọgide rue ọgwugwu ihe nile, onye ahu ka agāzọputa. 23 Ma mb͕e ọ bula ha sob͕uru unu n'obodo a, b͕alaga n'obodo di iche: n'ihi na n'ezie asim unu, Unu agaghi-agazù obodo nile nke Israel ma-ọli, rue mb͕e Nwa nke madu gābia. 24 Onye nēso uzọ onye-ozizí adighi-aka onye-ozizí-ya, orù adighi-aka kwa onye-nwe-ya. 25 O zuworo onye nēso uzọ onye-ozizí ka ọ di ka onye-ozizí-ya, na orù ahu ka ọ di ka onye-nwe-ya. Ọ buru na ha kpọrọ Nna-nwe-ulo Beelzebul, hà gēsi aṅa ghara ikpọ ndi èzí-na-ulo-Ya kari nke-uku? 26 Ya mere, unu atula egwu ha: n'ihi na ọ dighi ihe ọ bula ekpuchiworo ekpuchi, nke anāgaghi-ekpughe; ọ dighi kwa ihe ezoro ezo, nke anāgaghi-ama. 27 Okwu M'nāgwa unu n'ọchichiri, kwuenu ya n'ìhè: ihe unu nānu kwa na nti, kwusanu ya n'elu ulo. 28 Unu atu-kwa-la egwu ndi nēb͕u aru, ma ha apughi ib͕u nkpuru-obi: kama nātunu egwu Onye ahu Nke puru ila nkpuru-obi na aru n'iyì n'ọku ala-mọ. 29 Àdighi-ere egwele abua n'otù penny? ma otù nime ha agaghi-adà n'ala ma Nna-unu ekwegh: 30 ma ọbuná agiri-isi nile nke isi-unu ka aguworo. 31 Ya mere, unu atula egwu; ọnu-ahia unu onwe-unu kariri nke ọtutu egwele. 32 Ya mere, onye ọ bula nke gēkwuputam n'iru madu, ya ka Mu onwem gēkwuputa kwa n'iru Nnam Nke bi n'elu-igwe. 33 Ma onye ọ bula nke gāgọnarim n'iru madu, ya ka Mu onwem gāgọnari kwa n'iru Nnam Nke bi n'elu-igwe. 34 Unu echèla na abiaram itubà udó n'elu uwa: abiaghm itubà udó, kama ọ bu mma-agha. 35 N'ihi na abiaram ikewa nwoke megide nna-ya, na nwa-nwanyi megide nne-ya, na nwunye nwa megide nne di-ya: 36 ọ bu kwa ndi èzí-na-ulo madu gābu ndi-iro-ya. 37 Onye nāhu nna-ya ma-ọbu nne-ya n'anya kari Mu adighi-ekwesim; onye nāhu kwa nwa-ya nwoke ma-ọbu nwa-ya nwanyi n'anya kari Mu adighi-ekwesim. 38 Onye nānaraghi kwa obe-ya sokwam n'azu, adighi-ekwesim. 39 Onye chọtara ndu-ya gētufu ya; onye tufu-kwa-ra ndu-ya n'ihim gāchọta ya. 40 Onye nānara unu nke-ọma, ọ bu Mu ka ọ nānara nke-ọma, onye nānara kwa Mu onwem nke-ọma nānara Onye ziterem nke-ọma. 41 Onye nānara onye-amuma nke-ọma n'aha onye-amuma gānara ugwọ-ọlu onye-amuma; onye nānara kwa onye ezi omume nke-ọma n'aha onye ezi omume gānara ugwọ-ọlu onye ezi omume. 42 Onye ọ bula nke gēkuru nání iko miri oyi nye otù onye nime ndi ntà ndia ṅua n'aha onye nēso uzọm, n'ezie asim unu, ọ gaghi-etufu ugwọ-ọlu-ya ma-ọli.

Matiu 11

1 O rue, mb͕e Jisus nyebìri ndikom iri na abua ahu ndi nēso uzọ-Ya iwu, O si n'ebe ahu pua izí ihe na ikwusa n'obodo nile ha. 2 Ma mb͕e Jọn nuru n'ulo-nkpọrọ ọlu nile nke Kraist ahu, o ziga ozi site n'aka ndi nēso uzọ-ya, 3 si Ya, Gì onwe-gi bu Onye nābia, ma-ọbu na ayi nēle anya onye di iche? 4 Jisus we za, si ha, Ganu, kọrọ Jọn ihe nile unu nānu na nke unu nāhu: 5 ndi-ìsì nāhu uzọ, ndi-ngwurọ nēje ije, anēme ndi-ekpenta ka ha di ọcha, ndi nti chiri nānu ihe, anēme ndi nwuru anwu ka ha si n'ọnwu bilie, anēzì ndi-ob͕eye ozi ọma. 6 Ngọzi nādi-kwa-ra onye ahu, bú onye ọ bula nke nāgaghi-ama n'ọnyà n'arum. 7 Ma mb͕e ndia nāla, Jisus malitere igwa ìgwè madu nile okwu bayere Jọn, si, Ọ̀ bu gini ka unu puru je n'ọhia ka unu kiri? àmì nke nēme nkpatu site n'ifufe? 8 Ma ọ̀ bu gini ka unu puru ka unu hu? ǹwoke eyikwasiworo uwe di biali-biali? Le, ndi nēyi uwe di biali-biali nọ n'ulo ndi-eze. 9 Ma gini mere unu ji pua? ìhu onye-amuma? E, asim unu, onye kari kwa onye-amuma nke-uku. 10 Nwoke a bu onye edeworo ihe n'akwukwọ nsọ bayere ya, si, Le, Mu onwem nēziga onye-ozim n'iru Gi, Onye gēmezi uzọ-Gi n'iru Gi. 11 N'ezie asim unu, N'etiti ndi ndinyom muru ọ dighi onye biliworo nke ka Jọn Baptist uku: ma onye dikariri ntà n'ala-eze elu-igwe ka ya uku. 12 Site n'ubọchi Jọn Baptist rue ub͕u a anēme kwa ala-eze elu-igwe ihe-ike, ndi nēme ihe-ike nāpunara ya. 13 N'ihi na ndi-amuma nile na iwu Chineke buru amuma rue ubọchi Jọn. 14 Ọ buru kwa na unu nāchọ inara ya nke-ọma, nwoke ahu bu Elaija, nke gaje ibia. 15 Onye nwere nti inu ihe, ya nu. 16 Ma M'gēji ọb͕ọ a tuyere gini? O yiri umu-ntakiri ndi nānọdu n'ọma-ahia, ndi nākpọ ibe-ha òkù, 17 si, Ayi b͕uru unu ọ̀jà, ma unu eteghi egwú; ayi kwara ákwá, ma unu etighi aka n'obi. 18 N'ihi na Jọn biara nērighi ihe-oriri nāṅughi kwa ihe-ọṅuṅu, ha we si, O nwere mọ ọjọ. 19 Nwa nke madu biara nēri ihe-oriri nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, ha we si, Le, onye-ori-nke-uku, na onye-oké-ọṅu-manya, eyì ndi-ọna-utu na ndi-nmehie! Agu-kwa-ra amam-ihe n'onye ezi omume site n'ọlu-ya nile. 20 Mb͕e ahu ka Ọ malitere ita obodo ahu uta, bú nke Ọ lukariri ọlu-Ya di ike nime ha, n'ihi na ha echègharighi. 21 Ahuhu gādiri gi, Korazin; ahuhu gādiri gi, Betsaida; n'ihi na asi na alururi ọlu nile di ike na Taia na Saidon nke aluru nime unu, ha gēchèghariwori n'oge di anya gara aga n'ákwà-nkpe na ntu. 22 Otú ọ di, asim unu, Taia na Saidon gānagide okwu n'ubọchi ikpé, kari unu. 23 Gi onwe-gi kwa, Kapanaum, àgēweli gi rue elu-igwe? i gārida rue Hedis: n'ihi na asi na alururi ọlu nile di ike na Sọdọm nke aluru nime gi, ọ gānọgidewori rue ta. 24 Otú ọ di, asim unu, na ala Sọdọm gānagide okwu n'ubọchi ikpé kari gi. 25 N'oge ahu Jisus zara, si, Ekelem I, Nna, Onye-nwe elu-igwe na uwa, na I zonariri ndi-amam-ihe na ndi nwere nghọta ihe ndia, I were kwa ha kpughere umu ọhu: 26 e, Nna, ekelem I na ọ di ezi nma otú a n'iru Gi. 27 Nnam rara ihe nile nyem n'aka: ọ dighi kwa onye ọ bula mazuru Ọkpara ahu, ma-ọbughi Nna-Ya; ọ dighi kwa onye mazuru Nna ahu, ma-ọbughi Ọkpara-Ya, na onye ọ bula Ọkpara nēzube ikpughe Ya nye ya. 28 Biakutenum, unu nile ndi nādọb͕u onwe-unu n'ọlu, ndi ebowo-kwa-ra ibu di arọ́, Mu onwem gēme kwa ka unu zuru ike. 29 Nyaranu yoke nkem n'olu-unu, muta-kwa-nu ihe n'ọnum; n'ihi na abum Onye nwayọ na Onye wedatara Onwe-ya ala n'obi: unu gāhu kwa izu-ike nye nkpuru-obi-unu. 30 N'ihi na yoke nkem adighi-eb͕u nb͕u, ibum di kwa nfé.

Matiu 12

1 N'oge ahu Jisus gara n'etiti ubi ọka n'ubọchi-izu-ike; ma agu nāgu ndi nēso uzọ-Ya, ha we malite ighọ oko ọka, na ita ya. 2 Ma ndi-Farisi, mb͕e ha huru ya, ha si Ya, Le, ndi nēso uzọ-Gi nēme ihe nēzighi ezi n'iwu ime n'ubọchi-izu-ike. 3 Ma Ọ siri ha, Ùnu agughi ihe Devid mere, mb͕e agu guru ya, na ndi soro ya; 4 otú ọ batara n'ulo Chineke, rie ob͕e achicha anēche n'iru Chineke, nke nēzighi ezi n'iwu ka o rie, ma-ọbu ndi so ya, kama ọ bu nání ndi-nchu-àjà ka o ziri ezi? 5 Ma-ọbu ùnu agughi n'iwu, na ndi-nchu-àjà nēmeru ubọchi-izu-ike n'ulo uku Chineke n'ubọchi-izu-ike, ma adighi-ata ha uta? 6 Ma asim unu, na Onye di uku kari ulo Chineke nọ n'ebe a. 7 Ma ọ buru na unu marari ihe okwu a bu, Anamachọ ebere, ọ bughi àjà, unu agaghi-ekpeb͕u ndi adighi-ata ha uta. 8 N'ihi na Nwa nke madu bu Onye-nwe ubọchi-izu-ike. 9 O we si n'ebe ahu pua, ba n'ulo-nzukọ-ha: 10 ma le, otù nwoke nke nwere aka kpọnwuru akpọnwu. Ha we jua Ya, si, Ò ziri ezi n'iwu ime ka aru madu di ike n'ubọchi-izu-ike? ka ha we bo Ya ebubo. 11 ma Ọ siri ha, Òle madu gādi n'etiti unu, nke gēnwe otù aturu, ma ọ buru na aturu ahu adabà nime olùlù n'ubọchi-izu-ike, ọ̀ gaghi-ejide ya, dọgoputa ya? 12 Òle kwa ka ọ ra, bú otú ọnu-ahia madu kariri nke aturu oké ọnu! Ya mere o ziri ezi n'iwu ime ihe ọma n'ubọchi-izu-ike. 13 Mb͕e ahu Ọ si nwoke ahu, Setipu aka-gi. O we setipu ya; ewe me ka aka-ya di nma, dika nke-ọzọ. 14 Ndi-Farisi we pua, b͕a izù imegide Ya, ka ha gēsi la Ya n'iyì. 15 Ma ebe Jisus mara ya, O si n'ebe ahu wezuga Onwe-ya: ọtutu madu we so Ya; O we me ka aru di ha nile ike, 16 O we dọ ha aka na nti ka ha ghara ime ka Ọ puta ìhè: 17 ka okwu ekwuru site n'ọnu Aisaia onye-amuma we mezu, si, 18 Le, Onye nējerem ozi Onye M'rọputara; Onye M'huru n'anya, Onye ihe-Ya di nkpuru-obim ezi nma: M'gātukwasi Ya Mọ nkem, Ọ gākọ-kwa-ra mba nile akukọ ikpé. 19 Ọ gaghi-alu ọ̀gù, Ọ gaghi-etisi kwa nkpu ike; Ọ dighi kwa onye ọ bula gānu olu-Ya n'amá. 20 Ọ gaghi-akpaji ami apiara apia, Ọ gaghi-emenyu kwa ogho-oriọna nākwu anwuru-ọku, Rue mb͕e Ọ gātupu ikpé-Ya rue na nmeri. 21 Ọ bu kwa n'aha-Ya ka mba nile gātukwasi obi. 22 Mb͕e ahu ekutara Ya otù onye mọ ọjọ ji, bú onye kpuru ìsì nke da-kwa-ra ob͕i: O we me ka aru-ya di ike, ya mere onye-ob͕i ahu kwuru okwu hu kwa uzọ. 23 Ibobo we nwua ìgwè madu ahu nile n'aru, ha we si, Nwoke a, Ọ̀ gābu nwa Devid? 24 Ma mb͕e ndi-Farisi nuru ya, ha si, Nwoke a adighi-achupu ndi-mọ ọjọ, ma-ọbughi n'ike Beelzebul onye-isi ndi-mọ ọjọ ahu. 25 Ma ebe Ọ matara ihe di ha n'obi Ọ si ha, Ala-eze ọ bula nke kewara megide onwe-ya, anēme ya ka ọ tọb͕ọrọ n'efu; obodo ma-ọbu èzí-na-ulo ọ bula nke kewa-kwa-ra megide onwe-ya agaghi-eguzo: 26 Ọ buru kwa na Setan achupu Setan, o kewara megide onwe-ya; àla-eze-ya gēsi kwa aṅa guzo? 27 Ọ buru kwa na Mu onwem achupu ndi-mọ ọjọ n'ike Beelzebul, n'ìke onye ka umu-unu ndikom nāchupu ha? n'ihi nka ha gābu ndi-ikpé-unu. 28 Ma ọ buru na Mu onwem achupu ndi-mọ ọjọ n'ike Mọ nke Chineke, ya mere ala-eze Chineke ruru unu aru. 29 Ma-ọbu màdu gēsi aṅa pu ibà n'ulo onye di ike, na ipunara ya ihe-ya nile, ma ọ buru na o bughi uzọ ke onye ahu di ike ab͕u? mb͕e ahu ọ gāpunara kwa ya ihe di n'ulo-ya. 30 Onye nādighi n'akukum nēmegidem; onye nādighi-esokwam ikpokọta ihe nāchusa achusa. 31 N'ihi nka ka M'ji si unu, Agāb͕aghara madu nmehie na nkwulu ọ bula; ma agaghi-ab͕aghara nkwulu ekwuluru Mọ Nsọ. 32 Ọzọ, onye ọ bula nke gēkwu okwu megide Nwa nke madu, agāb͕aghara ya; ma onye ọ bula nke gēkwu megide Mọ Nsọ, agaghi-ab͕aghara ya, ọ bughi n'oge a, ọ bughi kwa n'oge nke gaje ibia. 33 Menu osisi ka ọ di nma, menu nkpuru-ya ka ọ di kwa nma; ma-ọbu menu osisi ka ọ buru osisi nābaghi n'ihe, menu nkpuru-ya ka ọ buru kwa nkpuru nābaghi n'ihe: n'ihi na amara osisi site na nkpuru-ya. 34 Umu nke aju-ala, ùnu gēsi aṅa pu ikwu ezi ihe, ebe unu bu ajọ madu? n'ihi na ọnu site n'ihe nke obi nwebigara ókè nēkwu okwu. 35 Ezi madu nēsi n'ezi àkù-ya atuputa ezi ihe: ajọ madu nēsi kwa n'ajọ àkù-ya atuputa ajọ ihe. 36 Ma asim unu, na okwu ọ bula madu gēkwu nke nābaghi n'ihe, ha gāza ajuju bayere ya n'ubọchi ikpé. 37 N'ihi na agēsite n'okwu-ọnu-gi nile gu gi n'onye ezi omume, agēsite kwa n'okwu-ọnu-gi nile kpeb͕u gi. 38 Mb͕e ahu ufọdu n'etiti ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi zara Ya, si, Onye-ozizí, ayi nāchọ ihu ihe-iriba-ama site n'aka-Gi. 39 Ma Ọ zara, si ha, Ajọ ọb͕ọ nke nākwa kwa iko nāchọ ihe-iriba-ama; agaghi-enye kwa ya ihe-iriba-ama ma-ọbughi ihe-iriba-ama nke Jona onye-amuma: 40 n'ihi na dika Jona nọrọ ubọchi atọ ehihie na abali n'afọ oké anu miri; otú a Nwa nke madu gānọ n'obi nke ala ubọchi atọ ehihie na abali. 41 Ndikom Nineve gēso ọb͕ọ a bilie n'ikpé ahu, ha gāma kwa ya ikpé: n'ihi na ha chèghariri na nkwusa nke Jona; ma le, Onye ka Jona nọ n'ebe a. 42 Agēme ka eze-nwanyi nke Ndida so ọb͕ọ a bilie n'ikpé ahu, ọ gāma kwa ya ikpé: n'ihi na o siri n'ebe uwa sọturu bia inu amam-ihe Solomon; ma le, Onye ka Solomon nọ n'ebe a. 43 Ma mb͕e ọ bula mọ nādighi ọcha siri n'aru madu pua, ọ nāgabiga n'ebe miri nādighi, nāchọ izu-ike, ma ọ dighi-achọta ya. 44 Mb͕e ahu ọ si, M'gālaghachi n'ulom ebe m'siri puta; mb͕e ọ biara, o we hu ya ka ọ tọb͕ọrọ n'efu, azachasia ya, dozisia ya. 45 Mb͕e ahu ọ ga, chiri mọ-ibe-ya asa nke jọkari ya onwe-ya njọ tiyere onwe-ya, ha we bà biri n'ebe ahu: ọnọdu ikpe-azu nke madu ahu bia jọkari nke-mbu. Otú a ka ọ gādi-kwa-ra ajọ ọb͕ọ a. 46 Mb͕e Ọ nọ nāgwa ìgwè madu nile okwu, le, nne-Ya na umu-nne-Ya guzoro n'èzí, nāchọ igwa Ya okwu. 47 Otù onye we si Ya, Le, nne-Gi na umu-nne-Gi nēguzo n'èzí, nāchọ igwa Gi okwu. 48 Ma Ọ zara, si onye gwara Ya, Ònye bu nnem? òle ndi bu kwa umu-nnem? 49 O we setipu aka-Ya n'ebe ndi nēso uzọ-Ya nọ, si, Le, nnem na umu-nnem! 50 N'ihi na onye ọ bula nke gēme ihe Nnam Nke bi n'elu-igwe nāchọ, onye ahu bu nwa-nnem nwoke, na nwa-nnem nwanyi, na nnem.

Matiu 13

1 N'ubọchi ahu Jisus puru n'ulo, we nọdu n'usọ oké osimiri. 2 Oké ìgwè madu we zukọ n'ebe Ọ nọ, ya mere Ọ batara n'ub͕ọ, nọdu ala; ìgwè madu ahu nile guzo-kwa-ra n'ótú. 3 O we gwa ha ọtutu okwu n'ilu di iche iche, si, Le, ọgha-nkpuru puru ka ọ gha nkpuru; 4 mb͕e ọ nāgha, ufọdu we da n'akuku uzọ, anu-ufe we bia tùturie ha: 5 nkpuru ọzọ we da n'ebe nkume, ebe ha nēnweghi ájá ri nne: ngwa ngwa ha we púlite, n'ihi na ha enweghi ájá di omimi: 6 ma mb͕e anyanwu wara, ha chanwua; ha we kpọnwua, n'ihi na ha enweghi nkpọrọgwu. 7 Nkpuru ọzọ we da n'elu ogwu; ogwu ahu we tolite, kpab͕ue ha. 8 Nkpuru ọzọ we da n'ala di nma, ha we nāmi nkpuru, otù ọgu ise, ọzọ ọgu atọ, ọzọ orú na iri. 9 Onye nwere nti, ya nu. 10 Ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya, si Ya, N'ìhi gini ka I nāgwa ha okwu n'ilu? 11 O we za, si ha, Ọ bu unu ka enyeworo imara ihe-omimi ala-eze elu-igwe, ma enyeghi ndi ahu. 12 N'ihi na onye ọ bula nke nwere, onye ahu ka agēnye, ọ gēnwebiga kwa ókè: ma onye ọ bula nke nēnweghi, ọbuná ihe o nwere ka agānapu ya. 13 N'ihi nka ka M'nāgwa ha okwu n'ilu; n'ihi na ha adighi-ahu n'ọhuhu, ha adighi-anu kwa n'ọnunu, ha adighi-anuta kwa. 14 Ma anēmezuru ha amuma nke Aisaia, nke si, N'ọnunu unu gānu, ma unu agaghi-anuta ma-ọli; N'ọhuhu unu gāhu kwa, ma unu agaghi-ahuta ma-ọli: 15 N'ihi na obi ndi nka mara abuba, Nti-ha kpọchi-kwa-ra, Ha kpuchi-kwa-ra anya-ha; Ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ ma eleghi anya, Ghara kwa iwere nti-ha nu ihe, Ghara kwa iwere obi-ha ghọta, Ghara kwa ichighari, Ka M'ghara kwa ime ka aru di ha ike. 16 Ma ngọzi nādiri anya-unu, n'ihi na ha nāhu uzọ; na nti-unu, n'ihi na ha nānu ihe. 17 N'ihi na n'ezie asim unu, na agu guru ọtutu ndi-amuma na ndi ezi omume ihu ihe unu nāhu, ma ha ahughi ha; na inu ihe unu nānu, ma ha anughi ha. 18 Ya mere, unu onwe-unu nu ilu nke ọgha-nkpuru ahu. 19 Mb͕e onye ọ bula nuru okwu ala-eze elu-igwe, ma ọ ghọtaghi ya, ajọ onye ahu abia, punara ihe aghaworo n'obi-ya. Onye a bu nke aghara n'akuku uzọ. 20 Onye agha-kwa-ra n'ebe nkume ahu, madu a bu onye nānu okwu ahu, ngwa ngwa o were ọṅù jide ya; 21 ma o nweghi nkpọrọgwu nime onwe-ya, kama ọ nānọ nwa oge; ma mb͕e nkpab͕u ma-ọbu nsob͕u putara n'ihi okwu ahu, ngwa ngwa ọ ma n'ọnyà. 22 Onye agha-kwa-ra n'etiti ogwu ahu, madu a bu onye nānu okwu ahu; ma ncheb͕u nke oge a na aghughọ nke àkù nākpab͕u okwu ahu, o we ghọ ihe nāmighi nkpuru. 23 Onye agha-kwa-ra n'ala ahu di nma, madu a bu onye nānu okwu ahu, we ghọta ya; onye nāmi nkpuru n'ezie, miputa, otù ọgu ise, ọzọ ọgu atọ, ọzọ orú na iri. 24 O were ilu ọzọ che n'iru ha, si, Ejiri ala-eze elu-igwe tuyere madu mb͕e ọ ghara nkpuru ọma n'ubi-ya: 25 ma mb͕e madu nāraru ura, onye-iro-ya biara we gha kwa ata n'etiti ọka, we la. 26 Ma mb͕e npute puru, we mia nkpuru, mb͕e ahu ata ahu puta-kwa-ra ìhè. 27 Ndi-orù nna-nwe-ulo ahu we biakute ya, si ya, Onye-nwe-ayi, i ghaghi nkpuru ọma n'ubi-gi? òle ebe kwa ka o si nwe ata? 28 Ọ si ha, Madu nke bu onye-iro mere nka. Ndi-orù-ya we si ya, Ì nāchọ kwa ka ayi je chikọputa ha? 29 Ma ọ si, É-è; ka unu we ghara iropu ha na ọka ma eleghi anya, mb͕e unu nāchikọputa ata. 30 Rapunu ha abua ka ha nābakọta uba rue owuwe-ihe-ubi: ma n'oge owuwe-ihe-ubi m'gāsi ndi nēwe ihe-ubi, Burunu uzọ chikọta ata ahu, ke kwa ha n'ùkwù ka unu rechapu ha ọku: ma kpokọtanu ọka ahu n'ọba nkem. 31 O were ilu ọzọ che n'iru ha, si, Ala-eze elu-igwe yiri nkpuru mustard, nke madu were, gha n'ubi-ya: 32 nke ọ bu ezie na ọ di ntà kari nkpuru nile; ma mb͕e ọ bara uba, o bùkari ihe nile anāku n'ubi, we ghọ osisi, nke mere ka anu-ufe nke elu-igwe bia nānọ n'alaka-ya. 33 Ọ turu ha ilu ọzọ, si, Ala-eze elu-igwe yiri ihe nēko achicha, nke nwanyi were, zobe na mb͕é utu ọka atọ, rue mb͕e utu ọka ahu dum kosiri. 34 Okwu nile ndia ka Jisus gwara ìgwè madu nile n'ilu; ma O jighi ilu Ọ dighi-agwa ha okwu ọ bula: 35 ka okwu ekwuru site n'ọnu onye-amuma we mezu, si, M'gāsaghe ọnum n'itu ilu; M'gēkwuwa ihe ezoworo ezo site na ntọ-ala uwa. 36 Mb͕e ahu Ọ rapuru ìgwè madu nile, we bà n'ulo-ha: ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya, si, Kọrọ ayi isi ilu ata di n'ubi ahu. 37 O we za, si, Onye nāgha nkpuru ọma ahu bu Nwa nke madu; 38 ubi ahu bu uwa; nkpuru ọma ahu, ndi ahu bu umu ala-eze elu-igwe; ata ahu bu umu ajọ onye ahu; 39 onye-iro ahu nke ghara ha bu ekwensu: owuwe-ihe-ubi bu ọgwugwu oge a; ndi ahu nēwe ihe-ubi bu ndi-mọ-ozi. 40 Ya mere dika anāchikọputa ata rechapu kwa ha n'ọku; otú a ka ọ gādi n'ọgwugwu oge a. 41 Nwa nke madu gēzipu ndi-mọ-ozi-Ya, ha gāchikọputa n'ala-eze-Ya ihe nile nēme ka ama n'ọnyà, na ndi nēme ihe nēmebi iwu, 42 ha gātubà kwa ha n'oké ọku ahu: n'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi. 43 Mb͕e ahu ka ndi ezi omume gēnwupu dika anyanwu n'ala-eze nke Nna-ha. Onye nwere nti, ya nu. 44 Ala-eze elu-igwe yiri àkù ezoworo n'ubi; nke madu huru, zobe kwa; n'ọṅù-ya o we la, re ihe nile o nwere, ka ha ra, we zuta ubi ahu. 45 Ọzọ kwa, ala-eze elu-igwe yiri onye-ahia nāchọ pearl ọma: 46 ma mb͕e ọ huru otù pearl di oké ọnu-ahia, ọ je, re ihe nile o nwere, ka ha ra, we zuta ya. 47 Ọzọ kwa, ala-eze elu-igwe yiri oké úb͕ú awuyere nime oké osimiri, nke kpokọta-kwa-ra ufọdu n'aha azù nile di iche iche: 48 nke, mb͕e o juru, ha dọgotara ya n'ótú; ha we nọdu, chikọta azù di nma tiye nime ihe, ma ha tufuru nke nādighi nma. 49 Otú a ka ọ gādi n'ọgwugwu oge a: ndi-mọ-ozi gāputa, kewaputa ndi bu ajọ madu n'etiti ndi ezi omume, 50 ha gātubà kwa ha n'oké ọku ahu: n'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi. 51 Ùnu aghọtawo ihe ndia nile? Ha si Ya, E. 52 O we si ha, N'ihi nka ode-akwukwọ ọ bula nke emere ka ọ buru onye nēso uzọ ala-eze elu-igwe, o yiri madu nke bu nna-nwe-ulo, onye nēsi n'àkù-ya atuputa ihe ọhu na ihe ochie. 53 O rue, mb͕e Jisus tubìri ilu ndia, O si n'ebe ahu zọlie. 54 O we bia n'ala nke aka Ya, nēzí ha ihe n'ulo-nzukọ-ha, nke mere ka ibobo nwua ha n'aru, ha we si, Òle ebe ka Nwoke a nwere amam-ihe a na ọlu ndia di ike? 55 Nwoke a, Ọ̀ bughi Nwa onye-ọ̀kà-ayi? àdighi-akpọ nne-Ya Meri? nà umu-nne-Ya ndikom, Jemes, na Josef, na Saimon, na Judas? 56 Na umu-nne-Ya ndinyom, hà nile anọghi n'etiti ayi? Òle ebe kwa Nwoke a nwere ihe ndia nile? 57 Ewe me ka ha ma n'ọnyà n'aru Ya. Ma Jisus siri ha, Onye-amuma abughi onye anādighi-asọpuru, ma-ọbughi n'ala nke aka ya, na n'ulo nke aka ya. 58 Ọ lughi kwa ọtutu ọlu di ike n'ebe ahu n'ihi ekweghi-ekwe-ha.

Matiu 14

1 N'oge ahu Herod, bú tetrarch, nuru akukọ Jisus, 2 o we si ndi nējere ya ozi, Nwoke a bu Jọn Baptist; o siwo na ndi nwuru anwu bilie; n'ihi nka ka ike ndia nālusi ọlu ike na Ya. 3 N'ihi na Herod jidereri Jọn, we ke ya ab͕u, tiye ya n'ulo-nkpọrọ n'ihi Herodias, nwunye Filip nwa-nna-ya. 4 N'ihi na Jọn nāsi ya, O zighi gi ezi n'iwu inwe ya dika nwunye. 5 Ọ bu ezie na ọ chọrọ ib͕u kwa ya, ma ọ turu egwu ọra ndi-Ju, n'ihi na ha guru ya n'onye-amuma. 6 Ma mb͕e ncheta ọmumu Herod ruru, nwa-nwanyi Herodias tere egwú n'etiti, o we tọ Herod utọ. 7 N'ihi ya o were iṅu-iyi kwe nkwa inye ya ihe ọ bula ọ gāriọ. 8 Ma ebe nne-ya kwaliri ya, ọ si, Nyem isi Jọn Baptist n'ọkwa n'ebe a. 9 O we wuta eze ahu n'obi: ma n'ihi iṅu-iyi-ya nile, na n'ihi ndi ya na ha nọduru na nri, o nyere iwu ka ewere ya nye ya; 10 o we ziga, bipu isi Jọn n'ulo-nkpọrọ. 11 Ewe bute isi-ya n'ọkwa, nye ya nwa-ab͕ọghọ ntà ahu: o we būru ya nye nne-ya. 12 Ndi nēso uzọ-ya we bia, būru ozu-ya, lì kwa ya; ha we je kọrọ Jisus. 13 Ma mb͕e Jisus nuru ya, O si n'ebe ahu wezuga Onwe-ya n'ub͕ọ, je iche rue ebe bu ọhia: mb͕e ìgwè madu nile nuru ya, ha we si n'obodo ahu nile so Ya n'ukwu ala. 14 O we puta, hu oké ìgwè madu, O we nwe ọmiko n'aru ha, me ndi-nriaria-ha ka aru-ha di ike. 15 Ma mb͕e o ruru anyasi, ndi nēso uzọ-Ya biakutere Ya, si, Ebe a bu ọhia, oge agawo kwa ub͕u a; zilaga ìgwè madu ndia, ka ha we je n'obodo ntà nile buruburu, zuru onwe-ha ihe-oriri. 16 Ma Jisus siri ha, Ọ dighi ha nkpà ka ha la; unu onwe-unu nye ha ihe ka ha rie. 17 Ha we si Ya, Ayi enweghi n'ebe a ma-ọbughi ob͕e achicha ise na azù abua. 18 O we si, Chita ha n'ebe a nyem. 19 O we gwa ìgwè madu nile ka ha nọdu n'elu ahihia; O we nara ob͕e achicha ise na azù abua ahu, le anya n'elu-igwe, gọzie ha, nyawaha, we nēnye ndi nēso uzọ-Ya ob͕e achicha ahu, ndi nēso uzọ-Ya nēnye kwa ìgwè madu nile. 20 Ha nile we rie, afọ ju-kwa-ra ha: ha we tutukọ nke fọduru nime iberibe ahu, nkata iri na abua juru. 21 Ma ndi riri ra ka nnù ndikom iri na nnù abua na ọgu iri, nāgughi ndinyom na umu-ntakiri. 22 Ngwa ngwa O we rugide ndi nēso uzọ-Ya ka ha ba n'ub͕ọ-ha, buru Ya uzọ gabiga n'ofè ọzọ, rue mb͕e Ya onwe-ya gēzilaga ìgwè madu nile. 23 Mb͕e O zilagasiri ìgwè madu nile, Ọ rigoro n'elu ugwu ahu iche ikpe ekpere: ma mb͕e o ruru anyasi, nání Ya nọ n'ebe ahu. 24 Ma ub͕ọ ahu di n'etiti oké osimiri ub͕u a, ebili-miri nēmekpa kwa ya aru; n'ihi na ifufe nēfegide ya. 25 Ma na nche nke-anọ n'abali Ọ biakutere ha, nēje ije n'elu oké osimiri. 26 Mb͕e ndi nēso uzọ-Ya huru Ya ka Ọ nēje ije n'elu oké osimiri, obi we lọ ha miri, ha si, Ọ bu mọ; ha we tie nkpu site n'egwù. 27 Ma ngwa ngwa Jisus gwara ha okwu, si, Nwenu obi-ike; ọ bu Mu: unu atula egwu. 28 Pita we za Ya, si, Onye-nwe-ayi, ọ buru na ọ bu Gi onwe-gi, sim biakute Gi n'elu miri. 29 Ọ si, Bia. Pita we si n'ub͕ọ rida, je ije n'elu miri ahu, ijekuru Jisus. 30 Ma mb͕e ọ huru ifufe, ọ tua egwu; ebe ọ malitere imìkpu, o ti kwa nkpu, si, Onye-nwe-ayi, zọputam. 31 Ngwa ngwa Jisus setiri aka-Ya, jide ya, si ya, Onye okwukwe ntà, n'ìhi gini ka i ji nwe obi abua? 32 Mb͕e ha rigoro n'ub͕ọ, ifufe we febìe. 33 Ma ndi nọ n'ub͕ọ ahu kpọrọ isi ala nye Ya, si, I bu Ọkpara Chineke n'ezie. 34 Mb͕e ha gabigasiri, ha bia rue ala, rue Genesaret. 35 Mb͕e ndikom ebe ahu mazuru Ya, ha we ziga n'ala ahu dum di buruburu, kutara Ya madu nile aru nādighi nma; 36 ha nāriọ kwa Ya ka ha metu ọnu-ọnu uwe-Ya aka, nání ya: ewe zọputa ha, ka ha ra, bú ndi meturu Ya aka.

Matiu 15

1 Mb͕e ahu ndi-Farisi na ndi-ode-akwukwọ siri na Jerusalem biakute Jisus, si, 2 N'ìhi gini ka ndi nēso uzọ-Gi nējehie n'ozizí ndi-okenye nyere ayi n'aka idebe? n'ihi na ha adighi-akwọ aka mb͕e ọ bula ha nēri nri. 3 Ma Ọ zara, si ha, N'ìhi gini ka unu onwe-unu nējehie kwa n'ihe Chineke nyere n'iwu n'ihi ozizí enyere unu n'aka? 4 N'ihi na Chineke siri, Sọpuru nna-gi na nne-gi: na, Onye kwujọrọ nna maọbu nne, ya nwua ọnwu ahu. 5 Ma unu onwe-unu nāsi, Onye ọ bula nke gāsi nna-ya ma-ọbu nne-ya, Ihe ọ bula i gēritari n'akam bu ihe enyere Chineke; 6 ọ gaghi-asọpuru nna-ya ma-ọbu nne-ya ma-ọli. Unu nēme kwa okwu Chineke ka ọ buru ihe-efu n'ihi ozizí enyere unu n'aka idebe. 7 Ndi-iru-abua, Aisaia buru amuma nke-ọma bayere unu, si, 8 Ndi nka nāsọpurum n'eb͕ub͕ere-ọnu-ha; Ma obi-ha di anya n'ebe M'nọ. 9 Ma ha nēbirim isi ala n'efu, Nēzì ihe madu nyere n'iwu ka ha buru ozizí-ha. 10 O we kpọ ìgwè madu ahu biakute Ya, Ọ si ha, Nurunu, ghọta-kwa-nu: 11 Ọ bughi ihe nābà n'ọnu nēmeru madu; kama ihe si n'ọnu puta, ọ bu nke ahu nēmeru madu. 12 Mb͕e ahu ndi nēso uzọ-Ya biakutere Ya, si Ya, Ì matawo na emere ka ndi-Farisi ma n'ọnyà, mb͕e ha nuru okwu ahu? 13 Ma Ọ zara, si, Agēropu ihe-ọkukú ọ bula nke Nnam nke elu-igwe nākughi. 14 Rapunu ha: ha bu ndi-ndú kpuru ìsì. Ma ọ buru na onye-ìsì edu onye-ìsì, ha abua gādabà n'olùlù. 15 Pita we za, si Ya, Kọrọ ayi isi ilu a. 16 O we si, Ùnu onwe-unu di kwa nēnweghi nghọta we rue ub͕u a? 17 Ùnu atugharighi uche-unu na ihe ọ bula nke nābà n'ọnu nāga n'afọ, ewe nyupu ya n'ulo-ǹsí? 18 Ma ihe nke si n'ọnu puta nēsi nime obi aputa; ihe ndia nēmeru kwa madu. 19 N'ihi na n'obi ka ajọ èchìchè nile, ib͕u-madu nile, ikwa-iko nile nke ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di, ikwa-iko nile, ori nile, àmà ugha nile, nkwulú nile, si aputa: 20 ndia bu ihe nēmeru madu: ma iwere aka anākwọghi akwọ iri ihe adighi-emeru madu. 21 Jisus we si n'ebe ahu pua, wezuga Onwe-ya ga n'akuku Taia na Saidon. 22 Ma le, otù nwanyi Kenean siri n'ókè-ala ahu puta, tie nkpu, si, Merem ebere, Onye-nwe-ayi, Nwa Devid; mọ ọjọ nējisi nwam nwanyi ike. 23 Ma Ọ zaghi ya okwu ọ bula. Ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya, nēkpere Ya, si, Zilaga ya; n'ihi na ọ nētiso ayi nkpu. 24 Ma Ọ zara, si, Eziteghm ma-ọbughi ijekuru aturu furu efu nke ulo Israel. 25 Ma nwanyi ahu biara nākpọ isi ala nye Ya, si, Onye-nwe-ayi, yerem aka. 26 Ma Ọ zara, si, Ọ dighi nma inara nri umu tupuru umu-nkita. 27 Ma ọ siri, E, Onye-nwe-ayi: n'ihi na ọbuná umu-nkita nēri ufọdu nime irighiri nke nādaputa na table nke ndi-nwe-ha. 28 Mb͕e ahu Jisus zara, si ya, Nwayi, okwukwe-gi di uku: ka emere gi dika i nāchọ. Ewe me ka aru di nwa-ya nwanyi ike site n'oge hour ahu. 29 Jisus we si n'ebe ahu pua bia n'usọ osimiri Galili; O we rigo n'ugwu ahu, we nọdu n'ebe ahu. 30 Ọtutu ìgwè madu we biakute Ya, chiri ndi-ngwurọ, ndi-ìsì, ndi-ob͕i, ndi-ọlusi, na ọtutu ndi-ọria di iche, tiyere onwe-ha, ha we tọb͕ọ ha n'ala n'ukwu-Ya; O we me ka aru-ha di ike: 31 ya mere na o juru ìgwè madu ahu anya, mb͕e ha huru ndi-ob͕i ka ha nēkwu okwu, na ndi-ọlusi ka aru-ha di nma, na ndi-ngwurọ ka ha nēje ije, na ndi-ìsì ka ha nāhu uzọ: ha we to Chineke nke Israel. 32 Jisus we kpọ ndi nēso uzọ-Ya ka ha biakute Ya, Ọ si, Enwerem ọmiko n'aru ìgwè madu a, n'ihi na Mu na ha nọgidere ubọchi atọ ub͕u a, ha enweghi kwa ihe ha gēri: ma achọghm izilaga ha n'ọnu efu, ka ha ghara ida #mbà n'uzọ ma eleghi anya. 33 Ndi nēso uzọ-Ya we si Ya, Òle ebe ka ayi gēsi nwe ọtutu ob͕e achicha ra otú a n'ọhia, inyeju oké ìgwè madu di otú a afọ? 34 Jisus we si ha, Ùnu nwere ob͕e achicha ole? Ha we si, Asa, na azù ntà ole-na-ole. 35 O we gwa ìgwè madu ahu ka ha nọdu ala; 36 O we nara ob͕e achicha asa ahu na azù ahu; mb͕e O kelesiri ekele, Ọ nyawa ha, we nēnye ndi nēso uzọ-Ya, ndi nēso uzọ-Ya nēnye kwa ìgwè madu nile. 37 Ha nile we rie, afọ ju kwa ha: ha we tutukọ nke fọduru nime iberibe ahu, abọ asa juru. 38 Ma ndi riri bu nnù ndikom iri, nāgughi ndinyom na umuaka. 39 Mb͕e O zilagasiri ìgwè madu nile, Ọ ba n'ub͕ọ ahu, bia n'ókè-ala Magadan.

Matiu 16

1 Ndi-Farisi na ndi-Sadusi we biakute Ya, jua Ya ka O gosi ha ihe-iriba-ama site n'elu-igwe, nānwa Ya. 2 Ma Ọ zara, si ha, Mb͕e o ruru anyasi, unu nāsi, Iru elu-igwe gādi nma: n'ihi na elu-igwe nācha uhie uhie. 3 N'ututu unu nāsi kwa, Iru elu-igwe gājọ njọ ta: n'ihi na elu-igwe nācha uhie uhie, b͕aru kwa. Unu mara itule iru elu-igwe, ma unu apughi itule ihe-iriba-ama nke oge ndia. 4 Ajọ ọb͕ọ nke nākwa kwa iko nāchọ ihe-iriba-ama; ma agaghi-enye ya ihe-iriba-ama, ma-ọbughi ihe-iriba-ama nke Jona. O we rapu ha, pua. 5 Ndi nēso uzọ-Ya we bia n'ofè ọzọ, chezọ kwa iji ob͕e achicha. 6 Jisus we si ha, Nēlenu anya, nēze kwa ihe ndi-Farisi na ndi-Sadusi, bú ihe nēko achicha. 7 Ha we nēkwurita n'etiti onwe-ha, si, Ayi ejighi ob͕e achicha. 8 Ma ebe Jisus mara ya Ọ si, Ndi okwukwe ntà, gini mere unu nēkwurita n'etiti onwe-unu, n'ihi na unu enweghi ob͕e achicha? 9 Ùnu akātugharighi uche, ùnu echetaghi kwa ob͕e achicha ise nke nnù ndikom iri na nnù abua na ọgu iri ahu, na nkata ole unu nara? 10 Ùnu echetaghi kwa ob͕e achicha asa nke nnù ndikom iri ahu, na abọ ole unu nara? 11 Ùnu si aṅa ghara itughari uche na agwaghm unu okwu bayere ob͕e achicha? Ma nēzenu ihe ndi-Farisi na ndi-Sadusi, bú ihe nēko achicha. 12 Mb͕e ahu ka ha ghọtara na Ọ sighi ha nēze ihe nēko ob͕e achicha, kama ka ha nēze ozizí ndi-Farisi na ndi-Sadusi. 13 Ma mb͕e Jisus biara n'akuku Sisaria Filipi, Ọ jua ndi nēso uzọ-Ya, si, Ònye ka madu nāsi na Nwa nke madu bu? 14 Ha we si, Ufọdu si, Jọn Baptist; ma ndi ọzọ si, Elaija: ma ibe-ha si, Jeremaia, ma-ọbu otù nime ndi-amuma. 15 Ọ si ha, Ma ọ̀ bu onye ka unu onwe-unu si na Mu bu? 16 Saimon Pita we za, si, Gi onwe-gi bu Kraist ahu, Ọkpara Chineke di ndu. 17 Jisus we za, si ya, Ngọzi nādiri gi, Saimon Bā-Jona: n'ihi na anu-aru na ọbara ekpugheghi ya nye gi, kama ọ bu Nnam Nke bi n'elu-igwe. 18 Ma Mu onwem si kwa gi, na gi onwe-gi bu Pita, ọ bu kwa n'elu oké nkume a ka M'gēwu nzukọm dika ulo; ọnu-uzọ nilenke Hedis agaghi-aka kwa ya n'ike. 19 M'gēnye gi nkpisi-ugodi nke ala-eze elu-igwe: ihe ọ bula i gēke kwa ab͕u n'elu uwa, agēke ya n'elu-igwe: ihe ọ bula i gātọpu kwa ab͕u n'elu uwa, agātọpu ya n'elu-igwe. 20 Mb͕e ahu Ọ dọrọ ndi nēso uzọ-Ya aka na nti ka ha ghara igwa onye ọ bula na Ya onwe-ya bu Kraist ahu. 21 Site na mb͕e ahu Jisus Kraist malitere igosi ndi nēso uzọ-Ya, na Ọ ghaghi ije Jerusalem, na ihu ọtutu ahuhu n'aka ndi-okenye na ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ, na aghaghi ib͕u Ya, me kwa ka O si n'ọnwu bilie n'ubochi nke-atọ. 22 Pita we kuru Ya nye n'aru, malite ibara Ya nba, si, Chineke mere Gi ebere, Onye-nwe-ayi: ihe a agaghi-adiri Gi ma-ọli. 23 Ma O chighariri, si Pita, Ga n'azum, Setan: i bu ihe nēme ka M'ma n'ọnyà: n'ihi na i dighi-atukwasi uche-gi n'ihe Chineke, kama ọ bu n'ihe madu. 24 Mb͕e ahu Jisus siri ndi nēso uzọ-Ya, Ọ buru na onye ọ bula achọ ka o som n'azu, ya ju onwe-ya, buli kwa obe-ya, nēsokwam. 25 N'ihi na onye ọ bula nke nāchọ izọputa ndu-ya, o gētufu ya: ma onye ọ bula nke gētufu ndu-ya n'ihim, ọ gāhu ya. 26 N'ihi na ùrù gini ka ọ gābara madu, ma ọ buru na o gērita uwa dum n'urù, ewe napu ya ndu-ya? ma-ọbu ìhe-nb͕anwe gini ka madu gēji b͕anwe ndu-ya? 27 N'ihi na Nwa nke madu gaje ibia n'ebube nke Nna-Ya, Ya na ndi-mọ-ozi-Ya; mb͕e ahu ka Ọ gēnyeghachi kwa onye ọ bula dika omume-ya si di. 28 N'ezie asim unu, Ufọdu di n'etiti ndi guzoro n'ebe a, ndi nāgaghi-edetu ọnwu ire ma-ọli rue mb͕e ha gāhu Nwa nke madu ka Ọ nābia n'ala-eze-Ya.

Matiu 17

1 Mb͕e ubọchi isi gasiri Jisus chiri Pita, na Jemes, na Jọn nwa-nne-ya, tiyere Onwe-ya, O kuru ha rigo n'ugwu di elu we pua iche: 2 O we nwogha n'iru ha: iru-Ya we nēnwupu dika anyanwu, uwe-Ya nile we nācha ucha dika ìhè. 3 Ma le, eme ka ha hu Moses na Elaija ka ha na Ya nēkwurita okwu. 4 Pita we za, si Jisus, Onye-nwe-ayi, ọ di nma ka ayi nọ n'ebe a: ọ buru na I nāchọ, m'gāma ulo-ikwū atọ n'ebe a; ka otù diri Gi, ka otù di-kwa-ra Moses, ka otù di-kwa-ra Elaija. 5 Mb͕e ọ kpu okwu n'ọnu, le, igwe-oji nke nēnwu enwu kpuchiri ha: le kwa, olu si n'igwe-oji ahu puta, si, Onye a bu Ọkparam M'huru n'anya, Onye ihe-Ya dim ezi nma; nurunu okwu-Ya. 6 Mb͕e ndi nēso uzọ-Ya nuru ya, ha we da kpuchie iru-ha n'ala, tu kwa egwu ri nne. 7 Jisus we biakute ha, metu ha aka, si, Bilienu, unu atu-kwa-la egwu. 8 Ma mb͕e ha weliri anya-ha elu, ha ahughi onye ọ bula, ma-ọbughi nání Jisus. 9 Mb͕e ha si n'ugwu ahu nārida, Jisus we nye ha iwu, si, Unu agwala onye ọ bula ihe unu huru, rue mb͕e Nwa nke madu gēsi na ndi nwuru anwu bilie. 10 Ndi nēso uzọ-Ya we jua Ya, si, Gini mere ndi-ode-akwukwọ ji si kwa na Elaija aghaghi ibu uzọ bia? 11 O we za, si, Ọ bu ezie na Elaija nābia, Ọ gēme kwa ka ihe nile di ka ha di na mbu: 12 ma asim unu, na Elaija abiawori ub͕u a, ha amazughi kwa ya, kama ha mere n'aru-ya ka ihe ha chọrọ ra. Ọbuná otú a ka ha gaje ime kwa ka Nwa nke madu hu ahuhu. 13 Mb͕e ahu ndi nēso uzọ-Ya ghọtara na Ọ gwara ha okwu bayere Jọn Baptist. 14 Mb͕e ha biakutere ìgwè madu ahu, otù nwoke we biakute Ya, nēb͕uru Ya ikperè, nāsi kwa, 15 Onye-nwe-ayi, mere nwam nwoke ebere: n'ihi na ọ bu onye ọnwa nēme ka anya ghara idi ya nma, ọ nāhu kwa ahuhu nke-uku: n'ihi na ọtutu mb͕e ọ nādabà n'ọku, ọtutu mb͕e ọ nādabà kwa na miri. 16 M'we kuru ya biakute ndi nēso uzọ-Gi, ma ha apughi ime ka aru-ya di ike. 17 Jisus we za, si, Unu ọb͕ọ nēnweghi okwukwe, nke nwe-kwa-ra anya-ùhìe, rùe ole mb͕e ka Mu na unu gānọ? rùe ole mb͕e ka M'gānagide unu? unu kutaram ya n'ebe a. 18 Jisus we bara ya nba; mọ ọjọ ahu we si nime ya puta: ewe me ka aru nwa-okoro ahu di ike site n'oge hour ahu. 19 Mb͕e ahu ndi nēso uzọ-Ya biakutere Jisus iche, si, N'ìhi gini ka ayi onwe-ayi nāpughi ichupu ya? 20 O we si ha, N'ihi okwukwe ntà unu: n'ihi na n'ezie asim unu, Ọ buru na unu nwere okwukwe dika nkpuru mustard, unu gāsi ugwu a, Si n'ebe a gabiga n'ebe ahu; ọ gāgabiga kwa; ihe ọ bula agaghi-adi kwa nke unu nāpughi ime. 21 Ma otú ọ di mọ di otú a apughi iputa ma-ọbughi site n'ekpere na ibu-ọnu. 22 Ma mb͕e ha bi na Galili, Jisus siri ha, Agaje irara Nwa nke madu nye n'aka madu; 23 ha gēb͕u kwa Ya, ewe me ka O si n'ọnwu bilie n'ubọchi nke-atọ. O we wuta ha ri nne. 24 Ma mb͕e ha biara na Kapanaum, ndi nānara ego ùtú biakutere Pita, si, Ònye-ozizí-unu adighi-atu ego ùtú? 25 Ọ si, E. Mb͕e ọ batara n'ulo, Jisus we buru uzọ gwa ya okwu, si, Gini bu uche-gi, Saimon? ndi-eze uwa, sìte n'aka ole ndi ka ha nānara ùtú-ahia ma-ọbu ùtú n'isi madu? n'àka umu-ha, ma-ọbu n'aka ndi-ọbìa? 26 Ma mb͕e ọ siri, N'aka ndi-ọbìa, Jisus si ya, Ya mere umu-ha puru nime ya. 27 Ma, ka ayi we ghara ime ka ha ma n'ọnyà, ga rue oké osimiri, tubà nko-azù, were azù nke buru uzọ puta; mb͕e i saghesiri ọnu-ya, i gāhu kwa otù shekel: were nke ahu, nye ha ka ọ buru nke Mu na gi.

Matiu 18

1 N'oge hour ahu ndi nēso uzọ-Ya biakutere Jisus, si, Ònye kwa dikariri uku n'ala-eze elu-igwe? 2 O we kpọ otù nwatakiri biakute Ya, Ọ debe ya n'etiti ha, 3 si, N'ezie asim unu, Ọ buru na unu echigharighi, bia di ka umu-ntakiri, unu agaghi-abà n'ala-eze elu-igwe ma-ọli. 4 Ya mere, onye ọ bula nke gēweda onwe-ya dika nwatakiri a, onye ahu dikariri uku n'ala-eze elu-igwe. 5 Ọzọ, onye ọ bula nke gānara otù nwatakiri di otú a nke-ọma n'aham, ọ bu Mu onwem ka ọ nānara nke-ọma: 6 ma onye ọ bula nke gēme otù nime ndi ntà ndia ndi kwere na Mu ka ọ ma n'ọnyà, ihe gābara ya urù bu ka ewere nkume-igwe-nri nke inyinya-ibu nādọkpughari kwuba ya n'olu, ka o mìkpu kwa n'ob͕u oké osimiri. 7 Ahuhu gādiri uwa site n'ihe di iche iche nēme ka madu ma n'ọnyà; n'ihi na ọ di nkpà na ihe ahu nēme ka madu ma n'ọnyà gābia; ma ahuhu gādiri madu ahu onye ihe ahu nēme ka madu ma n'ọnyà nēsite n'aka-ya bia. 8 Ma ọ buru na aka-gi ma-ọbu ukwu-gi eme gi ka i ma n'ọnyà, bipu ya, tupu kwa ya n'aru-gi: ọ di gi nma ibà na ndu n'ọlusi ma-ọbu na ngwurọ, kari inwe aka abua ma-ọbu ukwu abua atubà i n'ọku ebighi-ebi. 9 Ọ buru kwa na anya-gi eme gi ka i ma n'ọnyà, wepu ya, tupu kwa ya n'aru-gi: ọ di gi nma ibà na ndu nēnwe otù anya, kari inwe anya abua atubà gi n'ọku ala-mọ. 10 Lezienu anya ka unu ghara ilelì otù nime ndi ntà ndia anya; n'ihi na asim unu, na mb͕e nile ndi-mọ-ozi-ha n'elu-igwe nēlegide iru Nnam Nke bi n'elu-igwe. 11 N'ihi na Nwa nke madu biara izọputa ndi nile furu efu. 12 Gini bu uche-unu? ọ buru na onye ọ bula nwere ọgu aturu ise, ma otù nime ha hie uzọ, ọ̀ dighi-agha ọgu anọ na iri na iteghete ahu, ga ugwu, nāchọ nke ahu hiere uzọ? 13 Ma ọ buru na o nwere ka o si chọta ya, n'ezie asim unu, ọ nāṅuri n'isi ya kari n'isi ọgu anọ na iri na iteghete ahu nēhieghi uzọ. 14 Otú a ọ bughi ihe achọrọ n'iru Nna-unu Nke bi n'elu-igwe, ka otù nime ndi ntà ndia la n'iyì. 15 Ọzọ, ọ buru na nwa-nna-gi emehie megide gi, je, tua ya nmehie-ya n'anya n'etiti nání gi na ya abua: ọ buru na ọ nuru olu-gi, i ritara nwa-nna-gi n'urù. 16 Ma ọ buru na ọ nughi, kuru otù madu ma-ọbu madu abua ọzọ tiyere onwe-gi, ka ewe me okwu ọ bula ekwuru ka o guzo n'ọnu ndi-àmà abua ma-ọbu atọ. 17 Ma ọ buru na ọ ṅaghi ha nti, gwa nzukọm: ma ọ buru na ọ ṅaghi kwa nzukọm nti, ka ọ diri gi ka onye mba ozọ na onye-ọna-utu. 18 N'ezie asim unu, Ka ha ra, bú ihe unu gēke ab͕u n'elu uwa, agēke ha n'elu-igwe: ka ha ra kwa, bú ihe unu gātọpu n'elu uwa, agātọpu ha n'elu-igwe. 19 Ọzọ, asim unu, na ọ buru na madu abua n'etiti unu gēnwe otù olu n'elu uwa bayere ihe ọ bula ha gāriọ, agēme ya nye ha site na Nnam Nke bi n'elu-igwe. 20 N'ihi na ebe madu abua ma-ọbu atọ zukọworo n'aham, n'ebe ahu ka M'nọ n'etiti ha. 21 Mb͕e ahu Pita biakutere Ya, si Ya, Onye-nwe-ayi, ùb͕ò ole ka nwa-nnam gēmehie megidem, ewem b͕aghara ya? rùe ub͕ò asa? 22 Jisus si ya, Asighm i, Rue ub͕ò asa; kama, Rue ọgu ub͕ò atọ na iri uzọ asa. 23 N'ihi nka ewere ala-eze elu-igwe tuyere otù eze, onye chọrọ ka ya na ndi-orù-ya piazie. 24 Ma mb͕e ọ malitere ipiazi, ewe kutara ya otù onye, nke ji ya orú nnù talent na nnù ise. 25 Ma ebe o nweghi ihe o gēji kwughachi, onye-nwe-ya siri ka ere ya, na nwunye-ya, na umu-ya, na ihe nile o nwere, ka ha ra, ka akwughachi kwa ugwọ. 26 Ya mere orù ahu dara n'ala nākpọ isi ala nye ya, si, Onye-nwe-ayi, nwe ogologo-ntachi-obi n'arum, na m'gākwughachi gi ihe nile. 27 Ma ebe onye-nwe orù ahu nwere ọmiko n'aru ya, ọ rapu ya, b͕aghara kwa ya ihe ahu o binyere ya-ri. 28 Ma orù ahu puru, hu otù nime ndi-orù-ibe-ya, nke ji ya ọgu shilling ise: o we jidesie ya aka ike, ri ya aka n'akpiri, si, Kwughachim ihe i ji. 29 Ya mere orù-ibe-ya dara n'ala, riọ ya, si, Nwe ogologo-ntachi-obi n'arum, na m'gākwughachi gi. 30 Ma ọ chọgh: kama o jere tubà ya n'ulo-nkpọrọ, rue mb͕e ọ gākwughachi ihe o ji. 31 Ya mere mb͕e ndi-orù-ibe-ya huru ihe emere, o wuta ha ri nne n'obi, ha we bia kọrọ onye-nwe-ha ihe nile mere. 32 Mb͕e ahu onye-nwe-ya kpọrọ ya biakute ya, si ya, Ajọ orù, ab͕agharam i ugwọ ahu nile, n'ihi na i riọrọm: 33 ọ̀ kwesighi kwa gi imere orù-ibe-gi ebere ọbuná dika mu onwem mere gi ebere? 34 Onye-nwe-ya were iwe, we rara ya nye n'aka ndi-nmekpa-aru, rue mb͕e ọ gākwughachi ugwọ nile o ji. 35 Otú a ka Nnam nke elu-igwe gēme kwa unu, ọ buru na unu ab͕agharaghi, onye ọ bula nmehie nwa-nne-ya, site n'obi-unu.

Matiu 19

1 O rue, mb͕e Jisus kwubìri okwu ndia, O si na Galili zọlie, bia n'ókè-ala Judia n'ofè Jọdan; 2 oké ìgwè madu we so Ya; O we me ka aru-ha di ike n'ebe ahu. 3 Ndi-Farisi we biakute Ya, nānwa Ya, si, Ò ziri ezi n'iwu ka nwoke rapu nwunye-ya n'ihi ihe nile ọ bula? 4 O we za, si, Ùnu agughi na Onye kère ha site na nmalite mere ha nwoke na nwayi, 5 we si, N'ihi nka ka nwoke gārapu nna-ya na nne-ya, rapara n'aru nwunye-ya; ha abua ewe ghọ otù anu-aru? 6 Ya mere ha abughi kwa madu abua ọzọ, kama ọ bu otù anu-aru. Ya mere, ihe Chineke kekọtara, madu atọsala. 7 Ha si Ya, Gini kwa ka Moses ji nye iwu inye akwukwọ nkewa, na irapu ya? 8 Ọ si ha, Ọ bu n'ihi obi-etili-unu ka Moses kwere ka unu rapu nwunye-unu: ma site na nmalite adighi-eme otú a. 9 Ma asim unu, Onye ọ bula nke gārapu nwunye-ya, ma-ọbughi n'ihi ikwa-iko, luru kwa nwunye ọzọ, ọ nākwa iko: onye nke gālu nwanyi ahu mb͕e arapuworo ya nākwa kwa iko. 10 Ndi nēso uzọ-Ya si Ya, Ọ buru na okwu di otú a n'etiti nwoke na nwunye-ya, ọ baghi urù ilu nwunye. 11 Ma Ọ siri ha, Ọ bughi madu nile nānagide okwu a, kama ọ bu ndi enyeworo ya. 12 N'ihi na ndi-onozi di, ndi amuru otú a site n'afọ nne-ha: ndi-onozi di kwa, ndi emere onozi site n'aka madu: ndi-onozi di kwa, ndi mere onwe-ha onozi n'ihi ala-eze elu-igwe. Onye puru inagide ya, ya nagide. 13 Mb͕e ahu ekutara Ya umu-ntakiri, ka O we bikwasi ha aka-Ya abua, kpe kwa ekpere: ma ndi nēso uzọ-Ya bara ha nba. 14 Ma Jisus siri, Kwenu ka umu-ntakiri biakutem, unu eb͕ochi-kwa-la ha: n'ihi na ala-eze elu-igwe bu nke ndi di otú a. 15 O we bikwasi ha aka-Ya abua, si n'ebe ahu pua. 16 Ma le, otù onye biakutere Ya, si, Onye-ozizí, ọ̀ bu ezi ihe gini ka m'gēme, ka m'we nwe ndu ebighi-ebi? 17 Ma Ọ siri ya, Gini mere i nājum ajuju bayere nke bu ezi ihe? Otù Onye di Nke bu ezi Onye: ma ọ buru na i nāchọ ibà nime ndu ahu, debe ihe nile enyere n'iwu. 18 Ọ si Ya, Òle? Jisus we si, Eb͕ula madu, Akwala iko, Ezula ori, Ab͕ala àmà ugha, 19 Sọpuru nna-gi na nne-gi: na, Hu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi. 20 Nwa-okorọbia ahu si Ya, Ihe ndia nile ka m'ribara ama: gini fọdurum ọzọ ime? 21 Jisus siri ya, Ọ buru na i nāchọ ka i zue okè, laba, re ihe nile i nwere, nye ndi-ob͕eye, i gēnwe kwa àkù n'elu-igwe: bia kwa, som. 22 Ma mb͕e nwa-okorọbia ahu nuru okwu a, ọ lara na nwuta: n'ihi na ọ bu onye nwere ihe ri nne. 23 Jisus we si ndi nēso uzọ-Ya, N'ezie asim unu, Ọ diri ọgaranya ike ibà n'ala-eze elu-igwe. 24 Ọzọ kwa, asim unu, Ọ dikarari camel nfé igabiga n'anya àgìgá, kari ọgaranya ibà n'ala-eze Chineke. 25 Ma mb͕e ndi nēso uzọ-Ya nuru ya, ibobo nwuru ha n'aru ri nne, ha si, Ònye kwa ka apuru izọputa? 26 Ma Jisus lere ha anya, si ha, N'ebe madu nọ nka bu ihe anāpughi ime; ma apuru ime ihe nile n'ebe Chineke nọ. 27 Mb͕e ahu Pita zara, si Ya, Le, ayi onwe-ayi rapuru ihe nile, we so Gi; gini kwa ka ayi gēnwe? 28 Jisus we si ha, N'ezie asim unu, na unu onwe-unu ndi sorom, n'imu-ọzọ ahu, mb͕e ọ bula Nwa nke madu gānọkwasi n'oche-eze nke ebube-Ya, unu onwe-unu gānọkwasi kwa n'oche-eze iri na abua, nēkpe ebo iri na abua nke Israel ikpé. 29 Ọzọ, onye ọ bula nke rapuru ulo, ma-ọbu umu-nne ndikom, ma-ọbu umu-nne ndinyom, ma-ọbu nna, ma-ọbu nne, ma-ọbu umu, ma-ọbu ubi, n'ihi aham, ọ gānata ọgu ise ọgu ise, keta kwa ndu ebighi-ebi. 30 Ma ọtutu ndi bu uzọ gābu ndi-ikpe-azu; ndi ikpe-azu gābu kwa ndi bu uzọ.

Matiu 20

1 N'ihi na ala-eze elu-igwe yiri nwoke nke bu nna-nwe-ulo, onye puru n'isi-ututu igota ndi-ọlu ije n'ubi-vine-ya. 2 Ma mb͕e ya na ndi-ọlu ahu nwere otù olu ka o nye ha otù shilling kwa-ubọchi, o zigara ha n'ubi-vine ya. 3 Ọ we pua dika oge hour nke-atọ, hu ndi ọzọ ka ha nēguzo n'ọma-ahia nālughi ọlu; 4 o we si ndi ahu, Unu onwe-unu ga kwa n'ubi-vine nkem, ihe ọ bula ziri ezi ka m'gēnye unu. Ha we je. 5 Ọ we pu kwa ọzọ dika oge hour nke-isi na nke-iteghete, me kwa otú ahu. 6 Ọ we pua dika oge hour nke-iri-na-otù, hu ndi ọzọ ka ha nēguzo; ọ si ha, Gini mere unu guzoro n'ebe a ubọchi dum nālughi ọlu? 7 Ha si ya, N'ihi na ọ dighi onye ọ bula goro ayi ilu ọlu. Ọ si ha, Unu onwe-unu ga kwa n'ubi-vine nkem. 8 Ma mb͕e o ruru anyasi, onye-nwe ubi-vine ahu si onye o tiyere ihe-ya n'aka, Kpọ ndi-ọlu ahu, kwua ha ugwọ-ọlu-ha, malite site na ndi-ikpe-azu rue ndi bu uzọ. 9 Mb͕e ndi egoro n'oge hour nke-iri-na-otù biara, ha we nata otù onye otù shilling. 10 Ma mb͕e ndi bu uzọ biara, ha chère na ha gānata nke ka; ma ha onwe-ha nata-kwa-ra otù onye otù shilling. 11 Ma mb͕e ha natara ya, ha tamube megide nna-nwe-ulo ahu, 12 si, Ndi-ikpe-azu a luru otù hour, i we me ka ayi na ha ra, ayi ndi būru ibu arọ́ nke ubọchi ta, ya na ifufe di ọku. 13 Ma ọ zara otù onye nime ha, si, Eyìm, emejọghm i: mù na gi enweghi otù olu ka m'nye gi otù shilling? 14 Welie nke bu nke gi, la; anamachọ ka m'nye onye-ikpe-azu a dika m'nye-kwa-ra gi. 15 Ò zighi ezi n'iwu ka m'were ihe nile nkem me ihe m'nāchọ? ma-ọbu ànya-gi jọrọ njọ, n'ihi na mu onwem bu ezi madu? 16 Otú a ndi-ikpe-azu gēbu uzọ, ndi bu uzọ gābu kwa ndi-ikpe-azu. 17 Mb͕e Jisus nārigoro Jerusalem, O we kuru ndi-ozi iri na abua ahu iche, bú ndi nēso uzọ-Ya, tiyere Onwe-ya, O we si ha n'uzọ, 18 Le, ayi nārigoro Jerusalem; agārara kwa Nwa nke madu nye n'aka ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ; ha gāma kwa Ya ikpé ọnwu, 19 rara Ya nye n'aka ndi mba ọzọ ka ha me Ya ihe-ọchì, pia Ya ihe, kpọgide Ya n'obe: agēme kwa ka O si n'ọnwu bilie n'ubọchi nke-atọ. 20 Mb͕e ahu nne umu Zebedi biakutere Ya, ya na umu-ya ndikom, nākpọ isi ala nye Ya, nāriọ kwa Ya ihe n'aka. 21 O we si ya, Gini ka i nāchọ? Ọ si Ya, Kwue ka umum ndikom abua ndia nọdu, otù n'aka-nri-Gi, otù n'aka-ekpe-Gi, n'ala-eze-Gi. 22 Ma Jisus zara, si, Unu amataghi ihe unu nāriọ. Ùnu puru iṅu iko ahu nke Mu onwem gaje iṅu? Ha si Ya, Ayi puru. 23 Ọ si ha, Ikom ka unu gāṅu n'ezie: ma inọdu n'aka-nrim, na n'aka-ekpem, abughi nkem inye, kama ọ diri ndi Nnam doziworo ya. 24 Ma mb͕e ndi-ozi iri fọduru nuru ya, iwe were ha nke-uku n'ihi umu-nne abua ahu. 25 Ma Jisus kpọrọ ha biakute Ya, si, Unu amatawo na ndi bu isi nke mba nile ọzọ nēme ha dika ndi nwe ha: ndi uku ha nāchi kwa ha. 26 Ọ bughi otú a ka ọ gādi n'etiti unu: kama onye ọ bula nke nāchọ ka eme ya onye uku n'etiti unu, ọ gābu onye nējere unu ozi; 27 ọzọ, onye ọ bula nke nāchọ ka ọ buru onye-isi n'etiti unu, ọ gābu orù-unu: 28 dika Nwa nke madu abiaghi ka ejere Ya ozi, kama ka O je ozi, ka O were kwa ndu-Ya nye ka ọ buru ihe-nb͕aputa n'ọnọdu ọtutu madu. 29 Mb͕e ha nāputa na Jeriko, oké ìgwè madu we so Ya. 30 Ma le, ndi-ìsì abua ndi nānọdu n'akuku uzọ, mb͕e ha nuru na Jisus nāgabiga, ha tie nkpu, si, Onye-nwe-ayi, mere ayi ebere, Nwa Devid. 31 Ìgwè madu ahu we bara ha nba, ka ha kpuchie ọnu-ha: ma ha tikariri nkpu, si, Onye-nwe-ayi, mere ayi ebere, Nwa Devid. 32 Jisus we guzo, kpọ ha, we si, Gini ka unu nāchọ ka M'mere unu? 33 Ha si Ya, Onye-nwe-ayi, ka ewe meghe anya-ayi. 34 Ma Jisus, ebe O nwere ọmiko n'aru-ha, O we metu anya-ha aka: ngwa ngwa ewe me ka ha hu uzọ, ha we so Ya.

Matiu 21

1 Ma mb͕e ha biaruru Jerusalem nso, bia kwa na Betfagi, rue ugwu Olive, mb͕e ahu Jisus zigara madu abua nēso uzọ-Ya, 2 si ha, Ganu n'obodo ntà nke di na ncherita-iru unu, ngwa ngwa unu gāhu inyinya-ibu elibeworo, ya na nwa-inyinya-ibu: tọpunu ha, sekputaram ha. 3 Ọ buru kwa na onye ọ bula si unu ihe ọ bula, unu gāsi, Ha di Onye-nwe-ayi nkpà; ngwa ngwa ọ gēzite ha. 4 Ma emewo nka, ka okwu ekwuru site n'ọnu onye-amuma we mezu, si, 5 Sinu ada Zaion, Le, Eze-gi nābiakute gi, Ọ di nwayọ, Ọ nānọkwasi kwa n'inyinya-ibu, Na n'elu nwa-inyinya-ibu, bú nwa anu nēbu ibu. 6 Ndi ahu ndi nēso uzọ-Ya we ga, me dika Jisus nyere ha iwu, 7 ha we sekputa inyinya-ibu ahu, na nwa-inyinya-ibu ahu, wukwasi ha uwe-ha; O we nọkwasi ha. 8 Ndi kariri n'ìgwè madu ahu we tusa uwe-ha n'uzọ; ndi ọzọ b͕ubitara alaka n'osisi, tusa kwa ha n'uzọ. 9 Ìgwè madu nile ndi nāga n'iru Ya, ndi nēso kwa, nēti nkpu, si, Hosanna diri Nwa Devid: Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n'aha Onye-nwe-ayi; Hosanna n'ebe kachasi ihe nile elu. 10 Mb͕e Ọ batara na Jerusalem, obodo ahu nile we ma jijiji, si, Ònye bu Nwoke a? 11 Ìgwè madu ahu we nāsi, Nwoke a bu Onye-amuma ahu, Jisus, Nke si na Nazaret nke Galili bia. 12 Jisus we ba n'ulo uku Chineke, chupu ndi nile nēre nāzu kwa n'ulo uku Chineke, O we kpùe table nile nke ndi nāb͕anwe ego iru, na oche nile nke ndi nēre nduru; 13 Ọ si ha, Edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Agākpọ ulom ulo ekpere: ma unu onwe-unu nēme ya ọb͕à ndi nāpunara madu ihe. 14 Ndi-ìsi na ndi-ngwurọ we biakute Ya n'ulo uku Chineke: O we me ka aru-ha di ike. 15 Ma mb͕e ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ huru ọlu-ebube nile Ọ luru, na umuaka ndi nēti nkpu n'ulo uku Chineke, si, Hosanna diri Nwa Devid; iwe were ha nke-uku, 16 ha si Ya, Ì nānu okwu umuntakiri ndia nēkwu? Jisus we si ha, E: Ọ̀ dighi mb͕e ọ bula unu guru, I si n'ọnu umu ọhu na umu nāṅu ara me ka ọjija zue okè? 17 O we rapu ha, si n'obodo ahu pua je Betani, nọ ọnọdu-abali n'ebe ahu. 18 Ma n'ututu mb͕e Ọ nālaghachi n'obodo ahu, agu guru Ya. 19 Mb͕e Ọ huru otù osisi fig n'uzọ, Ọ biarue ya aru, ma Ọ hughi ihe ọ bula n'elu ya, ma-ọbughi nání akwukwọ ndu; O we si ya, Ka nkpuru ghara iputa n'elu gi ọzọ ebighi-ebi. Osisi fig ahu we kpọnwua n'otù mb͕e ahu. 20 Mb͕e ndi nēso uzọ-Ya huru ya, o ju ha anya, ha si, Òsisi fig ahu si aṅa kpọnwua n'otù mb͕e a? 21 Jisus we za, si ha, N'ezie asim unu, Ọ buru na unu nwere okwukwe, ghara inwe obi abua, ọ bughi nání ihe emere osisi fig nka ka unu gēme, ma ọ buru na unu gāsi ọbuná ugwu a, Ka ewelie gi, tubà gi nime oké osimiri, agēme ihe ahu. 22 Ihe nile, ka ha ra, bú nke unu gāriọ n'ekpere, ma asi na unu kwere, unu gānata kwa ha. 23 Mb͕e Ọ batara n'ulo uku Chineke, ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye nke ndi-Ju we biakute Ya mb͕e O nēzí ihe, si, Ọ̀ bu n'aha ike gini ka I nēme ihe ndia? ònye nye-kwa-ra Gi ike a? 24 Ma Jisus zara, si ha, Mu onwem gāju kwa unu otù okwu, ọ buru na unu agwam ya, Mu onwem gāgwa kwa unu aha ike M'ji eme ihe ndia. 25 Baptism nke Jọn, òle ebe o si puta? ò sitere n'elu-igwe, ma-ọbu na o sitere n'aka madu? Ha we kwurita n'etiti onwe-ha, si, Ọ buru na ayi asi, O sitere n'elu-igwe; Ọ gāsi ayi, N'ìhi gini kwa ka unu nējighi kwe ya? 26 Ma ọ buru na ayi asi, O sitere n'aka madu; ayi nātu egwu ìgwè madu a; n'ihi na madu nile nāgu Jọn dika onye-amuma. 27 Ha we za Jisus, si, Ayi amataghi. Ọ si-kwa-ra ha, Mu onwem agaghi-agwa kwa unu aha ike M'ji eme ihe ndia. 28 Ma gini bu uche-unu? Otù nwoke nwere umu abua; o we biakute nke-mbu, si, Nwa, je lua ọlu ta n'ubi-vine nkem. 29 Ma ọ zara, si, Achọghm ije: ma emesia ọ kwa uta, we je. 30 O we biakute nke-abua, kwue otú ahu. O we za, si, Mu onwem gēje, Onye-nwe-ayi: ma o jeghi. 31 Ònye nime ha abua mere ihe nna-ya chọrọ? Ha si, Onye mbu. Jisus si ha, N'ezie asim unu, na ndi-ọna-utu na ndinyom nke nākwa iko nēbu unu uzọ abà n'ala-eze Chineke. 32 N'ihi na Jọn biakutere unu n'uzọ ezi omume, ma unu ekweghi ya: ma ndi-ọna-utu na ndinyom nke nākwa iko kwere ya: ma mb͕e unu huru ya, unu onwe-unu akwaghi uta ọbuná emesia, ka unu we kwere ya. 33 Nurunu ilu ọzọ: Otù nwoke di, bú nna-nwe-ulo, onye kuru ubi-vine, b͕a ya ogige buruburu, gwu kwa ebe-nzọcha-nkpuru-vine nime ya, wu kwa ulo-elu, were kwa ya tiyere n'aka ndi-ọlu-ubi, we je ala ọzọ. 34 Ma mb͕e oge nkpuru ruru nso, o zigara ndi-orù-ya jekuru ndi-ọlu-ubi ahu, inata nkpuru-ya. 35 Ndi-ọlu-ubi ahu we jide ndi-orù-ya, pia otù onye ihe, b͕u kwa nke-ọzọ, tu kwa nke-ọzọ nkume. 36 Ọzọ, o zigara ndi-orù ọzọ di ọtutu kari ndi mbu: ha we me kwa ha otú ahu. 37 Ma emesia o zigara ha ọkpara-ya, si, Ha gāsọpuru ọkparam. 38 Ma ndi-ọlu-ubi ahu, mb͕e ha huru ọkpara ahu, ha sirita onwe-ha, Nka bu onye-nketa; bianu, ka ayi b͕ue ya, nwere kwa ihe-nketa-ya. 39 Ha we jide ya, tupu ya n'azu ubi-vine ahu, b͕ue ya. 40 Ya mere, mb͕e ọ bula onye-nwe ubi-vine ahu gābia, gini ka ọ gēme ndi-ọlu-ubi ahu? 41 Ha si ya, Ọ gāla ndi ọjọ ahu n'iyì n'uzọ jọrọ njọ, ọ gēwere kwa ubi-vine-ya tiye n'aka ndi-ọlu-ubi ọzọ, ndi gēnyeghachi ya nkpuru-ya n'oge-ha. 42 Jisus si ha, Ọ̀ dighi mb͕e ọ bula unu guru n'ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, Nkume nke ndi nēwu ulo juru, Nke ahu ka emere isi nkuku ulo: Ọ bu n'aka Onye-nwe-ayi ka nka sitere, Ọ bu kwa oké ọlu n'anya-ayi? 43 N'ihi nka ka M'ji si unu, Agānara unu ala-eze Chineke, we nye mba ọzọ nke nāmi nkpuru-ya. 44 Agētiwasi kwa onye dakwasiri nkume a: ma onye ọ bula ọ gādakwasi, ọ gēfesa ya dika ájá. 45 Mb͕e ndi-isi-nchu-aja na ndi-Farisi nuru ilu-Ya nile, ha we mara na Ọ nēkwu okwu bayere ha. 46 Mb͕e ha nāchọ ijide Ya, ha we tua egwu ìgwè madu nile, ebe ha guru Ya n'onye-amuma.

Matiu 22

1 Jisus we za, gwa ha okwu ọzọ n'ilu, si, 2 Eji ala-eze Chineke tuyere otù nwoke bú eze, nke siri oriri ọlulu-nwunye nye nwa-ya nwoke, 3 zipu kwa ndi-orù-ya ikpọ ndi akpọrọri ibia n'oriri ọlulu-nwunye ahu: ma ha achọghi ibia. 4 Ọzọ, o zipuru ndi-orù ọzọ, si, Gwa ndi akpọrọri, si, Le, edozisiwom oririm: eb͕usiwo oke-ehim nile na anum nile azùru azù, edozisiwo ihe nile: bianu n'oriri ọlulu-nwunye nkem. 5 Ma ha lefuru ya anya, je ebe nke ha, otù onye n'ubi nke aka ya, nke-ọzọ n'ihe-ahia-ya: 6 ma ndi fọduru jidere ndi-orù-ya, me ha ihe-ihere, b͕u kwa ha. 7 Ma eze ahu were iwe; o we ziga usu-ndi-agha-ya nile, la ndi-ob͕u-madu ahu n'iyì, rechapu kwa obodo-ha ọku. 8 Mb͕e ahu ọ si ndi-orù-ya, Edozisiwo ọlulu-nwunye nkem, ma ndi akpọrọri ekwesighi. 9 Ya mere, ganu n'ab͕ata uzọ nile, ka ha ra kwa, bú ndi unu gāhu, kpọ ha bia n'oriri ọlulu-nwunye nkem. 10 Ndi-orù ahu we pua ga n'uzọ nile, me ka madu nile ha huru zukọ, ka ha ra, ma ajọ madu ma ezi madu: ulo anālu nwunye we juputa na ndi nọduru na nri. 11 Ma mb͕e eze ahu batara ikiri ndi nọduru na nri, ọ hu n'ebe ahu otù nwoke nke nēyighi uwe ọlulu-nwunye: 12 o we si ya, Eyìm, ì si aṅa bata n'ebe a nēyighi uwe ọlulu-nwunye? Ma o kpuchiri ọnu. 13 Mb͕e ahu eze ahu siri ndi nējere ya ozi, Kenu ya ukwu na aka, tupu ya n'ọchichiri nke èzí; n'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi. 14 N'ihi na ndi akpọworo di ọtutu, ma ndi arọputaworo di ole-na -ole. 15 Mb͕e ahu ndi-Farisi gara, we b͕a ìzù otú ha gēme ka Ọ ma n'ọnyà n'okwu. 16 Ha we zigara Ya ndi nēso uzọ-ha, ha na ndi Herod, si, Onye-ozizí, ayi amatawo na I bu onye ezi-okwu, na I nēzí kwa uzọ Chineke n'ezi-okwu, na I dighi-asọ kwa onye ọ bula anya: n'ihi na I dighi-ele madu anya n'iru. 17 Ya mere, gwa ayi, Gini bu uche-Gi? Ò ziri ezi n'iwu itu ùtú nye Sisa, ma -ọbu na ò zighi ezi? 18 Ma Jisus mara ajọ ihe-ha, Ọ si, Gini mere unu nānwam, ndi-iru-abua? 19 Gosinum ego nke ùtú. Ha we wetara Ya otù shilling. 20 Ọ si ha, Ònye nwe onyinyo a na ihe a edekwasiri ya? 21 Ha si Ya, Sisa nwe. Mb͕e ahu Ọ si ha, Ya mere, nyeghachinu Sisa ihe nke Sisa, nyeghachi-kwa-nu Chineke ihe nke Chineke. 22 Mb͕e ha nuru ya, o we ju ha anya, ha we rapu Ya, je nke ha. 23 N'ubọchi ahu ndi-Sadusi biakutere Ya nāsi na nbilite-n'ọnwu adigh: ha we jua Ya, 24 si, Onye-ozizí, Moses siri, Ọ buru na nwoke anwua, nēnweghi umu, nwa-nne-ya nwoke gālu ọlu kwesiri nwa-nne di n'ebe nwunye-ya nọ, me ka nkpuru toputara nwa-nne-ya. 25 Ma umu-nne-ndikom asa di n'etiti ayi: nke-mbu luru nwunye, we nwua, ma ebe ọ nēnweghi nkpuru ọ rapuru nwunye-ya nye nwa-nne-ya; 26 otú a ka nke-abua me-kwa-ra, nke-atọ kwa, rue nke-asa. 27 Mb͕e ha nile nwusiri nwanyi ahu nwu-kwa-ra. 28 Ya mere, na nbilite-n'ọnwu nwùnye onye n'etiti ha asa ka ọ gābu? n'ihi na ha nile nwere ya na nwunye. 29 Ma Jisus zara, si ha, Unu nēhie uzọ, ebe unu amataghi ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, ma-ọbu ike Chineke. 30 N'ihi na nime nbilite-n'ọnwu ha alughi nwunye, enyeghi kwa ha n'ọlulu-di, kama ha di ka ndi-mọ-ozi di n'elu-igwe. 31 Ma n'okwu bayere nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu, ùnu agughi okwu Chineke gwara unu, si, 32 Mu onwem bu Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob? Chineke abughi Chineke nke ndi nwuru anwu, kama Ọ bu nke ndi di ndu. 33 Ma mb͕e ìgwè madu nile nuru ya, ibobo ozizí-Ya nwuru ha n'aru. 34 Ma ndi-Farisi, mb͕e ha nuru na O mereri ka ndi-Sadusi kpuchie ọnu-ha, ha zukọrọ n'otù ebe. 35 Otù onye n'etiti ha, bú onye-iwu, we jua Ya ajuju, nānwa Ya, 36 si, Onye-ozizí, òle ihe di uku nke enyere n'iwu nime iwu-ayi? 37 Ọ si ya, I gēwere obi-gi dum, were kwa nkpuru-obi-gi dum, were kwa uche-gi dum, hu Onye-nwe-ayi Chineke-gi n'anya. 38 Nka bu ihe uku na ihe mbu enyere n'iwu. 39 Ihe nke-abua nke yiri ya bu nka, I gāhu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi. 40 Iwu dum, na ndi-amuma Chineke, nēkokwasi n'ihe abua ndia enyere n'iwu. 41 Ma mb͕e ndi-Farisi zukọsiri, Jisus juru ha, 42 si, Gini bu uche-unu bayere Kraist ahu? Nwà onye ka Ọ bu? Ha si Ya, Nwa Devid. 43 Ọ si ha, Dèvid si kwa aṅa kpọ Ya Onye-nwe-ya nime Mọ Nsọ, si, 44 Onye-nwe-ayi siri Onye-nwem, Nọdu ala n'aka-nrim, Rue mb͕e M'gētiye ndi-iro-Gi n'okpuru ukwu-Gi abua? 45 Ya mere, ọ buru na Devid akpọ Ya Onye-nwe-ya, Ò si aṅa buru Nwa-ya? 46 Ma ọ dighi onye ọ bula puru iza Ya okwu, ọ dighi kwa onye nwere anya-ike site n'ubọchi ahu iju Ya ajuju ọzọ.

Matiu 23

1 Mb͕e ahu Jisus gwara ìgwè madu nile na ndi nēso uzọ-Ya okwu, 2 si, N'oche Moses ka ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi nọduru: 3 ya mere, ihe nile, ka ha ra, bú nke ha gāsi unu me, menu ihe ndia, debe kwa ha: ma unu emela dika ọlu nile ha si di; n'ihi na ha nēkwu, ma ha adighi-eme. 4 Ma ha nēke ibu di arọ́ di kwa ike obubu, tukwasi ha n'ubu madu; ma ha onwe-ha achọghi iji otù nkpisi-aka-ha wezuga ha. 5 Ma ọlu-ha nile ka ha nālu ka madu we kiri ha: n'ihi na ha nēme ka phylactery nile ha di obosara, me kwa ka ọnu-ọnu uwe-ha di uku, 6 ha nāhu kwa isi ọnọdu nile n'oriri nile unu n'anya, na isi oche nile n'ulo-nzukọ-unu, 7 na ekele n'ọma-ahia nile unu, na ka madu nākpọ ha, Rabai. 8 Ma ka aghara ikpọ unu onwe-unu, Rabai: n'ihi na otù Onye bu Onye-ozizí-unu, ma unu onwe-unu nile bu umu-nna. 9 Unu akpọ-kwa-la onye ọ bula nna-unu n'elu uwa: n'ihi na otù Onye bu Nna-unu, Ya bu Onye nke elu-igwe. 10 Ka aghara kwa ikpọ unu ndi-ndú, n'ihi na otù Onye bu Onye-ndú-unu, Ya bu Kraist ahu. 11 Ma onye dikariri uku n'etiti unu gābu onye nējere unu ozi. 12 Ma onye ọ bula nke gēweli onwe-ya elu, agēweda ya; onye ọ bula nke gēweda kwa onwe-ya, agēweli ya elu. 13 Ma ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nēmechi uzọ ala-eze elu-igwe n'iru madu: n'ihi na unu onwe-unu abataghi, unu adighi-ekwe kwa ndi nābata ka ha bata. 14 Ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nēripia ulo ndinyom di-ha nwuru, nēkpe kwa ogologo ekpere ka madu we hu unu: unu gēnwe ezi ọmuma-ikpe gabigara okè kari ndi ọzọ. 15 Ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nējeghari n'oké osimiri na ala kpọrọ nku buruburu ka unu me otù onye ka o so uzọ-unu; ma mb͕e ọ ghọrọ otú ahu, unu nēme ya okpukpu abua nwa ọku ala-mọ kari onwe-unu. 16 Ahuhu gādiri unu, ndi-ndú ìsì, ndi si, Onye ọ bula nke gēji ulo nsọ Chineke ṅu iyí, ọ bughi ihe; ma onye ọ bula nke gēji ọla-edo nke ulo nsọ ahu ṅu iyí, o ji ugwọ. 17 Ndi-nzuzu na ndi-ìsì: n'ihi na òle nke dikariri uku, ọla-edo ahu, ma-ọbu ulo nsọ nke doro ọla-edo ahu nsọ? 18 Unu si kwa, Onye ọ bula nke gēji ebe-ichu-àjà ṅu iyí, ọ bughi ihe; ma onye ọ bula nke gēji ihe-onyinye di n'elu ya ṅu iyí, o ji ugwọ. 19 Ndi-ìsì: n'ihi na òle nke ka uku, ihe-onyinye, ma-ọbu ebe-ichu-àjà nke nēdo ihe-onyinye ahu nsọ? 20 Ya mere, onye ji ebe-ichu-àjà ahu ṅu iyí, o ji ya, na ihe nile di n'elu ya, ṅu iyí. 21 Onye ji kwa ulo nsọ ahu ṅu iyí, o ji ya, na Onye bi nime ya, ṅu iyí. 22 Onye ji kwa elu-igwe ṅu iyí, o ji oche-eze Chineke, na Onye nọduru n'elu ya, ṅu iyí. 23 Ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nēnye otù uzọ n'uzọ iri nke nkpa-akwukwọ nēsì ísì utọ na anise na cummin, unu arapuwo kwa ihe ka arọ́ n'iwu, bú ikpé, na ebere, na okwukwe: ma ọ di nkpà ka unu me ihe ndia, ka unu ghara kwa irapu ihe ahu. 24 Ndi-ndú ìsì, ndi nāzapu anwu ntà, ma unu nēloda camel. 25 Ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nēme ka azu iko na afere di ọcha, ma n'ime ha juputara site n'ipunara madu ihe na ejideghi-onwe-unu. 26 Gi Farisi kpuru ìsì, buru uzọ me ka ime iko na afere di ọcha, ka azu-ha we ghọ kwa ọcha. 27 Ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu yiri ili eteworo nzu, nke nēgosi onwe-ha dika ihe ọma n'ìhè, ma n'ime ha juputara n'ọkpukpu nke ndi nwuru anwu, na adighi-ọcha nile. 28 Otú a unu onwe-unu nēgosi kwa onwe-unu nye madu n'ìhè dika ndi ezi omume, ma n'ime unu juputara n'iru-abua na ihe nēmebi iwu. 29 Ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nēwu ílì ndi-amuma, nēdozi kwa ebe anēlì ndi ezi omume, 30 unu nāsi kwa, Ọ buru na ayi nọri n'ubọchi nna-ayi-hà, ayi agaghi-eso ha n'inwekọ ọbara ndi-amuma. 31 Ya mere unu nāb͕a àmà megide onwe-unu, na unu bu umu nke ndi b͕uru ndi-amuma. 32 Unu onwe-unu mezu kwa ihe-ọtùtù nke nna-unu-hà. 33 Unu agwọ, unu aju-ala, ùnu gēsi aṅa b͕anari ikpé nke ọku ala-mọ? 34 N'ihi nka, le, Mu onwem nēzitere unu ndi-amuma, na ndi-amam-ihe, na ndi-ode-akwukwọ: ufọdu nime ha ka unu gēb͕u, kpọgide kwa ha n'obe; ufọdu nime ha ka unu gāpia kwa ihe n'ulo-nzukọ-unu, si kwa n'otù obodo nēsob͕u ha ga obodo ọzọ: 35 ka ọbara ndi ezi omume nile awusiworo n'elu uwa we biakwasi unu, site n'ọbara Ebel onye ezi omume ahu rue ọbara Zakaraia nwa Barakaia, onye unu b͕uru n'ab͕ata ulo nsọ na ebe-ichu-àjà-unu. 36 N'ezie asim unu, ihe ndia nile gābiakwasi ọb͕ọ a. 37 Jerusalem, Jerusalem, nke nēb͕u ndi-amuma, nke nēwere kwa nkume atu ndi eziteworo ya! ọ̀tutu mb͕e ole ka M'chọrọ ichikọ umu-gi, ọbuná dika nneku-ọkuku nāchikọ umu-ya n'okpuru nkù-ya abua, ma unu achọghi! 38 Le, anārapuru unu ulo-unu ka ọ tọb͕ọrọ n'efu. 39 N'ihi na asim unu, Unu agaghi-ahum ọzọ site n'ub͕u a ma-ọli, rue mb͕e unu gāsi, Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n'aha Onye-nwe-ayi.

Matiu 24

1 Jisus we si n'ulo uku Chineke pua, we nāga n'uzọ-Ya; ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya igosi Ya owuwu-ulo nile nke ulo uku Chineke. 2 Ma Ọ zara, si ha, Ùnu ahughi ihe ndia nile? n'ezie asim unu, Agaghi-arapu otù nkume ma-ọli n'ebe a n'elu nkume-ibe-ya, nke anāgaghi-akwatu n'ala. 3 Mb͕e Ọ nānọdu n'elu ugwu Olive, ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya iche, si, Gwa ayi, òle mb͕e ihe ndia gābu? gini gābu kwa ihe-iriba-ama nke ọbibia-Gi, na nke ọgwugwu oge a? 4 Jisus we za, si ha, Lezienu anya ka onye ọ bula ghara iduhie unu. 5 N'ihi na ọtutu madu gābia n'aham, si, Mu onwem bu Kraist ahu; ha gēduhie kwa ọtutu madu. 6 Unu gāje inu okwu agha di iche iche na akukọ agha di iche iche: lenu ka unu ghara itu ujọ: n'ihi na ihe ndia aghaghi iputa; ma ọgwugwu ihe nile akērughi. 7 N'ihi na mba gēbili imegide mba ọzọ, ala-eze gēbili kwa imegide ala-eze ọzọ: oké unwu na ala-ọma-jijiji gādi kwa n'ebe di iche iche. 8 Ma ihe ndia nile bu nmalite ihe-nb͕u. 9 Mb͕e ahu ka ha gārara unu nye na nkpab͕u, ha gēb͕u kwa unu: mba nile gākpọ kwa unu asì n'ihi aham. 10 Mb͕e ahu ka ọtutu madu gāma kwa n'ọnyà, rara kwa ibe-ha nye, kpọ kwa ibe-ha asì. 11 Ọtutu ndi-amuma ugha gēbili kwa, duhie kwa ọtutu madu. 12 N'ihi na ihe nēmebi iwu gāba uba, ihu-n'anya nke ndi ka n'etiti madu gāju kwa oyi. 13 Ma onye were ntachi-obi nọgide rue ọgwugwu ihe nile, onye ahu ka agāzọputa. 14 Agēkwusa kwa ozi ọma nka nke ala-eze elu-igwe n'elu-uwa dum madu bi, ka ọ buru àmà nye mba nile; mb͕e ahu ka ọgwugwu ihe nile gēru kwa. 15 Ya mere, mb͕e ọ bula unu gāhu ihe-árú nke nākpata itọb͕ọrọ-n'efu, nke ekwuru site n'ọnu Daniel onye-amuma, ka ọ nēguzo n'ebe nsọ unu (onye nāgu, ya tugharia uche), 16 mb͕e ahu ndi nọ na Judia, ka ha b͕alaga n'ugwu: 17 onye nọ n'elu ulo, ya ghara iridata ikwapu ihe di n'ulo-ya: 18 onye nọ kwa n'ubi, ya ghara ilaghachi ichiri uwe uku ya. 19 Ma ahuhu gādiri ndi di ime na ndi nēnye nwa ara na mb͕e ahu. 20 Ma kpenu ekpere ka nb͕apu-unu ghara idi na mb͕e oyi, ma-ọbu n'ubọchi-izu-ike: 21 n'ihi na mb͕e ahu ka nkpab͕u uku gādi, nke ihe dika ya akādighi site na nmalite uwa rue mb͕e a, é-è, ọ gaghi-adi kwa ma-ọli. 22 Ọ buru kwa na emeghi ubọchi ahu ka ha di nkpirikpi, agaghi-azọputa madu ọ bula: ma n'ihi ndi arọputara agēme ka ubọchi ahu di nkpirikpi. 23 Mb͕e ahu ọ buru na onye ọ bula gāsi unu, Le, Kraist nọ n'ebe a, ma-ọbu, N'ebe a; unu ekwela. 24 N'ihi na Kraist ugha di iche iche na ndi-amuma ugha gēbili, gosi kwa ihe-iriba-ama uku di iche iche na ọlu-ebube uku di iche iche; iduhie ọbuná ndi arọputara, ma ọ buru na ọ gēkwe me. 25 Le, agwawom unu mb͕e akēmeghi ya. 26 Ya mere, ọ buru na ha gāsi unu, Le, Ọ nọ n'ọhia; unu apula: Le, Ọ nọ n'ime-ulo; unu ekwela. 27 N'ihi na dika àmùmà si n'Ọwuwa-anyanwu puta, gosi kwa onwe-ya rue Ọdida-anyanwu; otú a ka ọbibia Nwa nke madu gādi. 28 Ebe ọ bula ozu di, n'ebe ahu ka udele gēzukọ. 29 Ma ngwa ngwa, mb͕e nkpab͕u mb͕e ahu gasiri, anyanwu gāb͕a ọchichiri, ọnwa agaghi-enye kwa ìhè-ya, kpakpando nile gāda kwa site n'elu-igwe, agēme kwa ka ike nile nke elu-igwe me nkpatu: 30 mb͕e ahu ka ihe-iriba-ama nke Nwa nke madu gāputa kwa ìhè n'elu-igwe: mb͕e ahu ka ebo nile nke uwa gēti kwa aka n'obi, ha gāhu kwa Nwa nke madu ka Ọ nābia n'elu igwe-oji nile nke elu-igwe n'ike na oké ebube. 31 Ọ gēwere kwa opì uku zipu ndi-mọ-ozi-Ya, ha gēme kwa ka ndi nke Ya arọputara si n'ifufe anọ zukọ, site n'otù nsọtu elu-igwe rue nsọtu-ya ọzọ. 32 Ma site n'aru osisi fig mutanu ilu-ya: mb͕e ọ bula alaka-ya dibara nrò ub͕u a, pute kwa akwukwọ-ndu-ya, unu mara na mb͕e okpom-ọku di nso; 33 otú a unu onwe-unu kwa, mb͕e ọ bula unu gāhu ihe ndia nile, maranu na Ọ nọ nso, n'ọnu-uzọ. 34 N'ezie asim unu, Ọb͕ọ a agaghi-agabiga ma-ọli, rue mb͕e ihe ndia nile gēme. 35 Elu-igwe na uwa gāgabiga, ma okwu nile nkem agaghi-agabiga ma-ọli. 36 Ma ọ dighi onye ọ bula matara ihe bayere ubọchi na oge hour ahu, ọbuná ndi-mọ-ozi nke elu-igwe amataghi, Ọkpara ahu amataghi kwa, kama ọ bu nání Nnam matara. 37 Ọ bu kwa dika ubọchi Noa diri, otú a ka ọbibia Nwa nke madu gādi. 38 N'ihi na dika ha nọ na mb͕e ahu nke bū oké iju-miri ahu uzọ nēri ihe nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, nālu nwunye, nēnye kwa n'ọlulu-di, rue ubọchi Noa batara n'ub͕ọ-ya, 39 ha amaghi kwa rue mb͕e oké iju-miri ahu biara, kpopu ha nile; otú a ka ọbibia Nwa nke madu gādi. 40 Mb͕e ahu madu abua gānọ n'ubì; ewere otù, rapu kwa otù: 41 ndinyom abua ganēgwe nri na nkume-igwe-nri; ewere otù, rapu kwa otù. 42 Ya mere, nēchenu nche: n'ihi na unu amataghi ubọchi Onye-nwe-unu gābia. 43 Ma unu mara nka, na ọ buru na nna-nwe-ulo matarari oge nche onye-ori gābia, ọ ganēche nche, ọ gaghi-ekwe kwa ka egwupú ulo-ya. 44 N'ihi nka unu onwe-unu buru kwa ndi edoziworo: n'ihi na n'oge hour nke unu nēchèghi ka Nwa nke madu gābia. 45 Ònye kwa bu orù ahu kwesiri ka atukwasi ya obi, nke nwe-kwa-ra uche, nke onye-nwe-ya mere onye-isi èzí-na-ulo-ya, inye ha ihe eji azù ha n'oge-ya? 46 Ngọzi nādiri orù ahu, onye, mb͕e onye-nwe-ya gābia, ọ gāhu ya ka ọ nēme otú a. 47 N'ezie asim unu, na ọ gēme ya onye-isi ihe nile o nwere. 48 Ma ọ buru na orù ọjọ ahu gāsi n'obi-ya, Onye-nwem nānọ ọdù di anya; 49 ọ buru kwa na ọ gāmalite iti ndi-orù-ibe-ya aka, so kwa ndi nāṅubiga manya ókè nēri nāṅu kwa; 50 onye-nwe orù ahu gābia n'ubọchi ọ nēleghi anya ya, na n'oge hour ọ nāmaghi, 51 ọ gēb͕ubi kwa ya nkpirikpi abua, kè òkè nye ya n'etiti ndi-iru-abua: n'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi.

Matiu 25

1 Mb͕e ahu agēji ala-eze elu-igwe tuyere umu-ab͕ọghọ iri, ndi chiri ọwa-ha, pua izute onye nālu nwunye ọhu. 2 Ma ise nime ha bu ndi-nzuzu, ise bu kwa ndi nwere uche. 3 N'ihi na ndi-nzuzu ahu, mb͕e ha chiri ọwa-ha, ha ejighi manu n'aka-ha: 4 ma ndi ahu nwere uche ji manu n'aria-ha tiyere ọwa-ha. 5 Ma mb͕e onye nālu nwunye ọhu nānọ ọdù di anya, ha nile rubere ura we raru. 6 Ma n'etiti abali iti-nkpu dara, Le, onye nālu nwunye ọhu! Putanu izute ya. 7 Mb͕e ahu umu-ab͕ọghọ ahu nile biliri, we dozie ọwa-ha. 8 Ndi-nzuzu we si ndi nwere uche, Nye ayi ufọdu na manu-unu; n'ihi na ọwa-ayi nānyu anyu. 9 Ma ndi nwere uche zara, si, É-è, eleghi anya ọ gaghi-ezuru ayi na unu: kama jekurunu ndi nēre, zuru nye onwe-unu. 10 Ma mb͕e ha nēje izú, onye nālu nwunye ọhu biara; ndi edoziworo we so ya ba n'oriri ọlulu-nwunye: ewe mechie uzọ. 11 Emesia umu-ab͕ọghọ fọduru bia kwa, nāsi, Onye-nwe-ayi, Onye-nwe-ayi, meghere ayi uzọ. 12 Ma ọ zara, si, N'ezie asim unu, amataghm unu. 13 Ya mere, nēchenu nche, n'ihi na unu amataghi ubọchi ahu ma-ọbu oge hour ahu. 14 N'ihi na ọ di ka mb͕e madu, mb͕e ọ gaje inọdu n'ala ndi ọzọ, ọ kpọrọ ndi-orù nke aka ya, rara ihe nile o nwere nye n'aka-ha. 15 Otù ka ọ nyere talent ise, nke-ọzọ talent abua, nke-ọzọ otù talent; o nye onye ọ bula dika ike nke aka ya ra; o we je inọdu n'ala ndi ọzọ. 16 Ngwa ngwa onye nara talent ise ahu gara were ha zua ahia, we rita urù talent ise ọzọ. 17 Otú ahu onye nara talent abua ahu rita-kwa-ra talent abua ọzọ. 18 Ma onye nara otù talent ahu jere gwu ala, zobe ego onye-nwe-ya. 19 Ma mb͕e ogologo oge gasiri onye-nwe ndi-orù ahu bia, ya na ha we piazi. 20 Onye ahu nke nara talent ise we biakute ya weta talent ise ọzọ, si, Onye-nwe-ayi, i rara talent ise nyem n'aka: le, eritaram talent ise ọzọ n'urù. 21 Onye-nwe-ya siri ya, I mere nke-ọma, ezi orù nke kwesiri ka atukwasi gi obi: i kwesiri ka atukwasi gi obi n'umu ihe ole-na-ole, m'gēme gi onye-isi ọtutu ihe: ba n'ọṅù nke onye-nwe-gi. 22 Onye nara talent abua ahu we biakute kwa ya, si, Onye-nwe-ayi, i rara talent abua nyem n'aka: le, eritaram talent abua ọzọ n'urù. 23 Onye-nwe-ya siri ya, I mere nke-ọma, ezi orù nke kwesiri ka atukwasi gi obi; i kwesiri ka atukwasi gi obi n'umu ihe ole-na-ole, m'gēme gi onye-isi ọtutu ihe: ba n'ọṅù nke onye-nwe-gi. 24 Onye narari otù talent ahu we biakute kwa ya, si, Onye-nwe-ayi, amaram i na i bu madu aka ike, nēwe ihe ubi n'ebe i nāghaghi nkpuru, nāchikọputa kwa n'ebe i nāfuchagh: 25 m'we tua egwu, we je zobe talent nke gi n'ala: le, i nwere nke gi. 26 Ma onye-nwe-ya zara, si ya, Ajọ orù nke di ume-ngwu, i matara na anamewe ihe ubi n'ebe m'nāghaghi nkpuru, nāchikọputa kwa n'ebe m'nāfuchaghi; 27 ya mere, ọ di gi nkpà iwere egom tiye n'aka ndi nāb͕anwe ego, mb͕e m'biara mu onwem gānaghachi kwa nkem, ya na uma. 28 Ya mere, napunu ya talent ahu, were kwa ya nye onye ahu nke nwere talent iri ahu. 29 N'ihi na onye ọ bula nke nwere ka agēnye, ọ gēnwebiga kwa ókè: ma site n'aka onye nēnweghi, ọbuná ihe o nwere ka agānapu ya. 30 Tupu-kwa-nu orù a nābaghi n'ihe n'ọchichiri nke èzí: n'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi. 31 Ma mb͕e ọ bula Nwa nke madu gābia n'ebube-Ya, Ya na ndi-mọ-ozi nile, mb͕e ahu ka Ọ gānọkwasi n'oche-eze nke ebube-Ya: 32 ma n'iru Ya ka agēme ka mba nile zukọ: Ọ gēkewaputa kwa ha, otù n'aru ibe-ya, dika onye nāzù aturu nēkewaputa aturu n'umu-ewu: 33 Ọ gēdebe kwa aturu n'aka-nri-Ya, ma umu-ewu n'aka-ekpe. 34 Mb͕e ahu Eze ahu gāsi ndi nọ n'aka-nri-Ya, Bianu, ndi agọziri agọzi nke Nnam, ketanu ala-eze edoziworo unu site na ntọ-ala nke uwa: 35 n'ihi na agu gurum, unu we nyem ihe M'gēri: akpiri kpọrọm nku, unu we kuru miri nyem: abum ọbìa, unu we kpọbatam; 36 ab͕aram ọtọ, unu we b͕okwasim ákwà: aru adighm ike, unu we letam: anọm n'ulo-nkpọrọ, unu we biakutem. 37 Mb͕e ahu ndi ezi omume ahu gāza Ya, si, Onye-nwe-ayi, òle mb͕e ayi huru Gi ka agu nāgu Gi, ayi we zùa Gi? ma-ọbu ka akpiri nākpọ Gi nku, ayi we kuru miri nye Gi? 38 Òle mb͕e ayi hu-kwa-ra Gi ka I bu ọbìa, ayi we kpọbata Gi? ma-ọbu ka I nāb͕a ọtọ, ayi we b͕okwasi Gi ákwà? 39 Òle mb͕e ayi hu-kwa-ra Gi ka aru nādighi ike, ma-ọbu n'ulo-nkpọrọ, ayi we biakute Gi? 40 Eze ahu gāza kwa, si ha, N'ezie asim unu, Ka ọ ra, bú otú unu si me ya nye otù onye nime umu-nnam ndia, bú ndi dikarisiri ntà, Mu ka unu mere ya nye. 41 Mb͕e ahu Ọ gāsi kwa ndi nọ n'aka-ekpe-Ya, Puanu n'irum, ndi anābu ọnu, ga n'ọku ebighi-ebi ahu nke edoziworo nye ekwensu na ndi-mọ-ozi-ya: 42 n'ihi na agu gurum, ma unu enyeghm ihe M'gēri: akpiri kpọrọm nku, ma unu ekughi miri nyem: 43 abum ọbìa, ma unu akpọbataghm; ab͕aram ọtọ, ma unu eb͕okwasighm ákwà; aru adighm ike, anọkwam n'ulo-nkpọrọ, ma unu eletaghm. 44 Mb͕e ahu ndi ahu gāza kwa, si, Onye-nwe-ayi, òle mb͕e ayi huru Gi ka agu nāgu Gi, ma-ọbu ka akpiri nākpọ Gi nku, ma-ọbu ka I bu ọbìa, ma-ọbu ka I nāb͕a ọtọ, ma-ọbu ka aru nādighi Gi ike, ma-ọbu ka I nọ n'ulo-nkpọrọ, ma ayi ejereghi Gi ozi? 45 Mb͕e ahu Ọ gāza ha, si, N'ezie asim unu, Ka ọ ra, bú otú unu nēmeghi ya nye otù onye nime ndia dikarisiri ntà, Mu ka unu nēmeghi ya nye. 46 Ndia gāpu je ba n'ahuhu-nmehie ebighi-ebi: ma ndi ezi omume gābà na ndu ebighi-ebi.

Matiu 26

1 O rue, mb͕e Jisus kwubìri okwu ndia nile, Ọ si ndi nēso uzọ-Ya, 2 Unu matara na mb͕e ubọchi abua gasiri ememe ngabiga nābia, arara kwa Nwa nke madu nye ka akpọgide Ya n'obe. 3 Mb͕e ahu ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye nke ndi-Ju zukọrọ n'obí onye-isi-nchu-àjà, onye anākpọ Kaiafas; 4 ha we b͕akọ ìzù ka ha we were aghughọ jide Jisus, b͕ue Ya. 5 Ma ha siri, Ọ bughi n'ememe a, ka ùzù we ghara iputa n'etiti ndi-Ju. 6 Ma mb͕e Jisus nọ na Betani, n'ulo Saimon onye-ekpenta, 7 otù nwanyi biakutere Ya nke nēji ite alabaster, nke manu-otite di oké ọnu-ahia nke-uku di ya, o we wusa manu-otite ahu n'isi-Ya, mb͕e Ọ nọduru na nri. 8 Ma mb͕e ndi nēso uzọ-Ya huru ya, iwe were ha nke-uku, ha si, Èji ila-n'iyì nka me gini? 9 N'ihi na apuru ire manu-otite a oké ọnu-ahia, we nye ndi-ob͕eye. 10 Ma mb͕e Jisus mara ya, Ọ si ha, Gini mere unu nēsob͕u nwanyi a? n'ihi na ọ luru ọlu ọma n'arum. 11 N'ihi na unu nwere ndi-ob͕eye n'etiti unu mb͕e nile; ma unu enweghi Mu onwem mb͕e nile. 12 N'ihi na n'iwusi manu-otite a n'arum, o mere ya ka o we doziem n'olìlì. 13 N'ezie asim unu, Ebe ọ bula agēkwusa ozi ọma nka n'uwa dum, agēkwuta kwa ihe nke nwanyi a mere, ka ọ buru ihe-ncheta-ya. 14 Mb͕e ahu otù onye nime ndi-ozi iri na abua ahu, onye anākpọ Judas Iskariot, jekuru ndi-isi-nchu-àjà, 15 si, Gini ka unu nāchọ inyem, mu onwem gārara kwa Ya nye n'aka-unu? Ha we tù orú ego ọla-ọcha na iri nye ya. 16 Site na mb͕e ahu o we chọ oghere irara Ya nye. 17 Ma n'ubọchi mbu nke achicha ekoghi-eko ndi nēso uzọ-Ya biakutere Jisus, si, Òle ebe I nāchọ ka ayi doziere Gi ka I we rie oriri ngabiga? 18 O we si, Jenu n'obodo a jekuru onye di otú a, si ya, Onye-ozizí si, Ogem di nso; Mu na ndi nēso uzọm nēme ememe ngabiga n'ulo-gi. 19 Ndi nēso uzọ-Ya we me dika Jisus nyere ha iwu; ha we dozie ememe ngabiga. 20 Ma mb͕e o ruru anyasi, Ya na ndikom iri na abua ahu ndi nēso uzọ-Ya nọduru na nri; 21 mb͕e ha nēri ihe, Ọ si, N'ezie asim unu, na otù onye si n'etiti unu puta gāraram nye. 22 O we wuta ha ri nne, ha nile n'otù n'otù we malite isi Ya, Ọ̀ bu mu, Onye-nwe-ayi? 23 Ma Ọ zara, si, Onye nke Mu na ya sukọrọ aka n'afere, onye ahu gāraram nye. 24 Nwa nke madu nāla, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ bayere Ya: ma ahuhu gādiri nwoke ahu onye anēsite n'aka-ya rara Nwa nke madu nye. Ọ buru na amughi nwoke ahu ọ gādi ya nma. 25 Judas, onye nārara ya nye, we za, si, Ọ̀ bu mu, Rabai? Ọ si ya, Gi onwe-gi kwuru. 26 Mb͕e ha nēri ihe, Jisus we nara ob͕e achicha, gọzie ya, nyawa ya; O we nye ndi nēso uzọ-Ya, si, Naranu, rie; nka bu arum. 27 O we nara iko, kele kwa, we nye ha, si, Unu nile ṅua nime ya; 28 n'ihi na nka bu ọbaram nke ọb͕ub͕a-ndu, nke anāwusiri ọtutu madu ka ewe b͕aghara nmehie. 29 Ma asim unu, M'gaghi-aṅu ma-ọli site n'ub͕u a n'ihe a si n'osisi vine puta, rue ubọchi ahu mb͕e Mu na unu gāṅu ya ọhu n'ala-eze Nnam. 30 Mb͕e ha bùsiri abù, ha pua je ugwu Olive. 31 Mb͕e ahu Jisus si ha, Agēme ka unu onwe-unu nile ma n'ọnyà n'arum abali ta: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, M'gētib͕u Onye-ọzùzù-aturu, agāb͕asa kwa aturu nke ìgwè aturu-ya. 32 Ma mb͕e emere ka M'si n'ọnwu bilie, M'gēburu unu uzọ ga Galili. 33 Ma Pita zara, si Ya, Ọ buru na agēme madu nile ka ha ma n'ọnyà n'aru Gi, agaghi-eme ka mu onwem ma n'ọnyà mb͕e ọ bula. 34 Jisus si ya, N'ezie asim i, na n'abali a, mb͕e oke-ọkuku akākwaghi ákwá, i gāgọnarim ub͕ò atọ. 35 Pita si Ya, Ọ buru na ọ di nkpà ọbuná ka m'so Gi nwua, agaghm-agọnari Gi ma-ọli. Ọ bu kwa otú a ka ndi ahu nile ndi nēso uzọ-Ya kwuru. 36 Mb͕e ahu Jisus na ha biarue ogige anākpọ Getsemane, Ọ we si ndi nēso uzọ-Ya, Nọdunu n'ebe a, rue mb͕e M'gēje n'ebe ahu kpe ekpere. 37 O we kuru Pita na umu Zebedi abua tiyere Onwe-ya, o we malite iwuta Ya n'obi, obi malite-kwa-ra ilọ Ya miri. 38 Mb͕e ahu Ọ si ha, Ọ nēwuta nkpuru-obim nke-uku, rue ọnwu: nọgidenu n'ebe a, som nēche nche. 39 O we ga n'iru nke-ntà, da kpuchiè iru-Ya n'ala, we kpe ekpere, si, Nnam, ọ buru na ọ gēkwe me, ka iko a gabigam: ma ọ bughi dika Mu onwem nāchọ, kama dika Gi onwe-gi nāchọ. 40 O we biakute ndi nēso uzọ-Ya, Ọ hu ha ka ha nāraru ura, O we si Pita, Ùnu di otú a nēnweghi ike isom che nche otù oge hour? 41 Nēchenu nche, nēkpe-kwa-nu ekpere, ka unu we ghara ibà n'ọnwunwa: mọ nke madu di ọku n'ezie, ma anu-aru adighi ike. 42 O we rapu ha je kwa ọzọ nke ub͕ò abua, kpe ekpere, si, Nnam, ọ buru na nka apughi igabiga, ma ọ buru na aṅughm ya, ka eme ihe I nāchọ. 43 O we bia kwa ọzọ, hu ha ka ha nāraru ura, n'ihi na anya-ha di arọ́. 44 O we rapu ha ọzọ, je, kpe ekpere nke ub͕ò atọ, nēkwu otù okwu ahu ọzọ. 45 Mb͕e ahu Ọ biakute ndi nēso uzọ-Ya, si ha, Nārarunu ura site n'ub͕u a, nēzu-kwa-nu ike: le, oge hour nkem di nso, anārara Nwa nke madu nye n'aka ndi-nmehie. 46 Bilienu, ka ayi je: le, onye nāraram nye nọ nso. 47 Mb͕e Ọ kpu okwu n'ọnu, le, Judas, otù onye n'etiti ndi-ozi iri na abua ahu, we bia, ya na oké ìgwè madu ndi chiri mma-agha na osisi, site n'ebe ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye nke ndi-Ju nọ. 48 Ma onye nārara Ya nye nyere ha ihe-iriba-ama, si, Onye ọ bula m'gēsutu ọnu, Onye ahu bu Ya: jidenu Ya. 49 Ngwa ngwa ọ biakutere Jisus, si, Ekele, Rabai; o we sutu Ya ọnu nke-uku. 50 Jisus we si ya, Eyim, me ihe i biara ime. Mb͕e ahu ha biakutere Ya, we tukwasi Jisus aka, jide Ya. 51 Ma le, otù onye nime ndi ha na Jisus nọ setiri aka-ya, miputa mma-agha-ya, b͕u orù onye-isi-nchu-aja mma, bipu nti-ya. 52 Mb͕e ahu Jisus si ya, Mighachi mma-agha-gi n'ọnọdu-ya: n'ihi na madu nile ndi were mma-agha gāla n'iyì site na mma-agha. 53 Ma-ọbu i nēchè na apughm iriọ Nnam, Ọ gēzite-kwa-ram ọbuná ub͕u a kari legion iri na abua nime ndi-mọ-ozi? 54 Ihe edeworo n'akwukwọ nsọ gēsi kwa aṅa mezu, na ọ ghaghi ime otú a? 55 N'oge hour ahu Jisus siri ìgwè madu ahu, Ùnu putara chiri mma-agha na osisi ijidem, dika imegide onye nāpunara madu ihe? Kwa-ubọchi M'nọduru n'ulo uku Chineke nēzí ihe, ma unu ejideghm. 56 Ma emewo ihe a dum, ka ihe nile ndi-amuma dere n'akwukwọ we mezu. Mb͕e ahu ndi nile nēso uzọ-Ya rapuru Ya, b͕alaga. 57 Ma ndi jidere Jisus si n'ebe ahu duru Ya je rue ulo Kaiafas onye-isi-nchu-àjà, ebe ndi-ode-akwukwọ na ndi-okenye zukọrọ. 58 Ma Pita soro Ya n'ebe di anya, rue obí onye-isi-nchu-àjà, o we ba nime, nọdu n'etiti ndi nēje ozi, ka ọ hu ọgwugwu-ya. 59 Ma ndi-isi-nchu-àjà na nnọkọ-ikpé dum nāchọ àmà ugha imegide Jisus, ka ha we me ka Ọ nwua; 60 ma ha achọtaghi, ọ bu ezie na ọtutu ndi-àmà ugha biara. Ma emesia abua biara, 61 si, Nwoke a siri, Apurum ikwatu ulo nsọ a nke Chineke, wu kwa ya n'ubọchi atọ. 62 Onye-isi-nchu-àjà we bilie, si Ya, Ì zaghi ihe ọ bula? gini bu àmà madu ndia nāb͕agide Gi? 63 Ma Jisus kpuchiri ọnu. Onye-isi-nchu-àjà we si Ya, Ewerem Chineke di ndu b͕a Gi iyí, ka I gwa ayi ma Gi onwe-gi bu Kraist ahu, Ọkpara Chineke. 64 Jisus si ya, Gi onwe-gi kwuru: otú ọ di, asim unu, Site n'ub͕u a unu gāhu Nwa nke madu ka Ọ nānọdu n'aka-nri nke ike, nābia kwa n'elu igwe-oji nile nke elu-igwe. 65 Mb͕e ahu onye-isi-nchu-àjà dọwara uwe-ya nile, si, O kwuluru Chineke: ọ̀ bu nkpà ndi-àmà gini nākpa ayi ọzọ? le, ub͕u a ka unu nuru nkwulu ahu: 66 gini bu uche-unu? Ha we za, si, O kwesiri inwu ọnwu. 67 Mb͕e ahu ha busara Ya ọnu-miri n'iru, ti kwa Ya aka: ufọdu we pia Ya ihe, 68 si, Buru ayi amuma, Kraist: ònye bu onye ahu nke tiri Gi aka? 69 Ma Pita nọduru n'èzí n'obí: otù nwa-ab͕ọghọ we biakute ya, si, Gi onwe-gi na Jisus Onye Galili nọ-kwa-ra. 70 Ma ọ gọrọ n'iru ha nile, si, Amataghm ihe i nēkwu. 71 Ma mb͕e ọ puru je n'uzọ-nbata, nwa-ab͕ọghọ ọzọ huru ya, ọ si ndi nọ n'ebe ahu, Nwoke a na Jisus Onye Nazaret nọ-kwa-ra. 72 O were iṅu-iyí gọ kwa ọzọ, si, Amataghm Nwoke a. 73 Ma mb͕e nwa oge gasiri ndi guzoro nso biakutere Pita, si ya, N'ezie gi onwe-gi bu kwa otù onye nime ha; n'ihi na okwu-ọnu-gi nēweputa gi n'ìhè. 74 Mb͕e ahu ọ malitere idu ikwù na iṅu iyí, si, Amataghm Nwoke a. Ngwa ngwa oke-ọkuku we kwa ákwá. 75 Pita we cheta okwu Jisus kwururi, si, Mb͕e oke-ọkuku akākwaghi, i gāgọnarim ub͕ò atọ. O we pua, kwa ákwá nke-uku.

Matiu 27

1 Ma mb͕e o ruru ututu, ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye nile nke ndi-Ju b͕ara ìzù megide Jisus ime ka Ọ nwua: 2 ha we ke Ya ab͕u, dupu Ya, rara Ya nye n'aka Pailat onye-isi. 3 Mb͕e ahu Judas, onye rara Ya nye, mb͕e ọ huru na amara Ya ikpé, ọ kwa uta, chighachi orú ego ọla-ọcha na iri ahu nye ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye, 4 si, Emehierem n'irara ọbara Onye ikpé nāmaghi nye. Ma ha siri, Òle nke diri ayi nime ya? gi onwe-gi le nke ahu. 5 O we tubà ego ọla-ọcha ahu nile n'ulo nsọ, wezuga onwe-ya; o we je, kwub͕u onwe-ya. 6 Ndi-isi-nchu-àjà we nara ego ọla-ọcha nile, si, O zighi ezi n'iwu itubà ha n'ebe anēdebe ihe enyere Chineke, ebe ọ bu ọnu-ahia ọbara. 7 Ha we b͕a ìzù, chiri ha zuta ubi ọkpu-ite, ilì ndi-ọbìa. 8 N'ihi nka ka akpọrọ ubi ahu, Ubi ọbara, rue ta. 9 Mb͕e ahu okwu ekwuru site n'ọnu Jeremaia onye-amuma mezuru, si, Ha we chiri orú ego ọla-ọcha na iri ahu, bú ọnu-ahia nke Onye aruru ọnu-ahia-Ya, Onye ufọdu site na umu Israel ruru ọnu-ahia-Ya; 10 ha we nye ha iji zuru ubi ọkpu-ite, dika Onye-nwe-ayi nyerem iwu. 11 Ma Jisus guzoro n'iru onye-isi: onye-isi ahu we jua Ya, si, Gì onwe-gi bu Eze ndi-Ju? Jisus we si ya, Gi onwe-gi kwuru. 12 Ma mb͕e ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye nēbo Ya ebubo, Ọ zaghi ihe ọ bula. 13 Mb͕e ahu Pailat si Ya, Ì nughi ka ọtutu ihe ha nāb͕a àmà megide Gi ra? 14 Ma Ọ zaghi ya, ọbuná rue otù okwu: ya mere na o juru onye-isi ahu anya nke-uku. 15 Ma n'ememe onye-isi nārapuru ọra ndi-Ju otù onye-nkpọrọ, onye ha nāchọ. 16 Ma mb͕e ahu ha nwere onye-nkpọrọ onye ọra madu mara, anākpọ Barabas. 17 Ya mere, mb͕e ha zukọrọ, Pailat si ha, Ònye ka unu nāchọ ka m'rapuru unu? Barabas, ma-ọbu Jisus Onye anākpọ Kraist? 18 N'ihi na ọ matara na ha rara Ya-ri nye n'ihi ekworo. 19 Mb͕e ọ nọkwasiri n'oche-ikpé, nwunye-ya zigara ya, si, Aka-gi adila n'okwu Onye ezi omume ahu: n'ihi na ahujurum ọtutu ihe anya na nrọ ta n'ihi Ya. 20 Ma ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye rafuru ìgwè madu nile ka ha riọ ya Barabas, ma la Jisus n'iyì. 21 Ma onye-isi ahu zara, si ha, Ònye nime madu abua ahu ka unu nāchọ ka m'rapuru unu? Ha we si, Barabas. 22 Pailat si ha, Ọ̀ bu gini ka m'gēme kwa Jisus Onye anākpọ Kraist? Ha nile si, Ka akpọgide Ya n'obe. 23 O we si, É-è, n'ihi na Ò mere ihe ọjọ gini? Ma ha tibigara nkpu ókè, si, Ka akpọgide Ya n'obe. 24 Ma mb͕e Pailat huru na okwu-ya abaghi n'ihe ọ bula, kama na ùzù nāputa, o were miri, kwọ aka-ya abua n'iru ìgwè madu ahu, si, Ikpé ọbara Onye ezi omume a amaghm: unu onwe-unu le nke ahu. 25 Ndi-Ju nile we za, si, Ọbara-Ya di ayi n'isi, di kwa n'isi umu-ayi. 26 Mb͕e ahu ọ rapuru ha Barabas: ma ọ rara Jisus nye, mb͕e ọ piasiri Ya ihe, ka ewe kpọgide Ya n'obe. 27 Mb͕e ahu ndi-agha nke onye-isi kuru Jisus tiyere onwe-ha ba na Pritoriọm, ha we me ka òtù-ha dum zukọ n'ebe Ọ nọ. 28 Ha we yipu uwe-Ya, yikwasi Ya uwe uhie. 29 Mb͕e ha kpasiri okpu-eze nke eji ogwu me, ha were ya kpube Ya n'isi, nye kwa Ya amì n'aka-nri-Ya; ha we b͕ue ikperè n'iru Ya, me Ya ihe-ọchì, si, Ekele, Eze ndi-Ju! 30 Ha busa-kwa-ra Ya ọnu-miri, were kwa amì ahu nēti Ya n'isi. 31 Mb͕e ha mesiri Ya ihe-ọchì, ha we yipu Ya uwe ahu, yikwasi Ya uwe-Ya nile, dupuga Ya ikpọgide Ya n'obe. 32 Ma mb͕e ha nāputa, ha huru otù nwoke onye Sairini, aha-ya bu Saimon: onye ahu ka ha jidere ka o so ha, ka o we būru obe-Ya. 33 Mb͕e ha biara n'ebe anākpọ Gọlgọta, nke bu, Ebe okpokoro-isi, 34 ha we nye Ya manya-vine nke agwara òlùlù ka Ọ ṅua: ma mb͕e O deturu ya ire, Ọ chọghi ka Ọ ṅua. 35 Mb͕e ha kpọgidesiri Ya n'obe, ha kère uwe-Ya n'etiti ha, nēfe nzà: ka o wee mezuo bụ ihe si n'ọnụ onye amụma Pita, Ha nēkere onwe-ha uwem, n'elu bụ ihe m n'eyi n'aru ka ha nēfe kwa nza. 36 ha we nọdu nēche Ya n'ebe ahu. 37 Ha debe-kwa-ra n'elu isi-Ya ihe eboro Ya nke edeworo n'akwukwọ, si, ONYE A BU JISUS EZE NDI-JU. 38 Mb͕e ahu akpọgidere ndikom abua tiyere Ya, bú ndi nāpunara madu ihe, otù onye n'aka-nri-Ya, na otù onye n'aka-ekpe. 39 Ndi nāgabiga nēkwulu kwa Ya, nēfufe isi-ha, 40 nāsi kwa, Gi Onye nākwatu ulo nsọ ayi, Onye nēwu kwa ya n'ubọchi atọ, zọputa Onwe-gi: ọ buru na I bu Ọkpara Chineke, si n'elu obe ridata. 41 Otú ahu ka ndi-isi-nchu-àjà nēkwu kwa, ebe ha na ndi-ode-akwukwọ na ndi-okenye nēme Ya ihe-ọchì, si, 42 Ọ zọputara ndi ọzọ; Ọ pughi izọputa Onwe-ya. Ọ bu Eze Israel; ka O si n'elu obe ridata ub͕u a, ayi gēkwe kwa na Ya. 43 Ọ nātukwasi obi-Ya na Chineke; ka Ọ dọputa Ya ub͕u a, ọ buru na Ọ nāchọ Ya: n'ihi na Ọ siri, Abum Ọkpara Chineke. 44 Ndi ahu nāpunara madu ihe, ndi akpọgidere Ya na ha n'obe, nāta kwa Ya uta otù aka ahu. 45 Ma site n'oge hour nke-isi ọchichiri b͕ara n'ala ahu nile rue oge hour nke-iteghete. 46 Ma dika oge hour nke-iteghete Jisus were oké olu tie nkpu, si, Eli, Eli, lama sabaktani? nke bu, Chinekem, Chinekem, ọ̀ bu n'ihi gini ka I rapuru nání Mu? 47 Ufọdu n'etiti ndi guzoro n'ebe ahu, mb͕e ha nuru ya, ha we si, Elaija ka Nwoke a nākpọ. 48 Ngwa ngwa otù onye nime ha we b͕a ọsọ, were sponge, b͕aju ya na manya-vine b͕ara uka, tukwasi ya n'amì, nye Ya ka Ọ ṅua. 49 Ndi fọduru we si, Rapu; ka ayi hu ma Elaija nābia izọputa Ya. 50 Ma Jisus were oké olu ti nkpu ọzọ, we ra mọ-Ya nye Chineke. 51 Ma le, ákwà-nb͕ochi nke ulo nsọ Chineke b͕awara iberibe abua site n'elu rue ala; ala ma-kwa-ra jijiji; oké nkume b͕awa-kwa-ra; 52 ílì meghe-kwa-ra; ewe me ka aru ọtutu ndi di nsọ ndi raruri ura si n'ọnwu bilie; 53 ha we si n'ebe anēlì ozu puta mb͕e nbilite-n'ọnwu-Ya gasiri, we ba n'obodo nsọ, were onwe-ha gosi ọtutu madu. 54 Ma ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, na ndi ha na ya nọ nēche Jisus, mb͕e ha huru ala-ọma-jijiji ahu, na ihe nile emere, ha tua egwu ri nne, si, N'ezie Nwoke a bu Ọkpara Chineke. 55 Ọtutu ndinyom nọ kwa n'ebe ahu ndi nọ n'ebe di anya nēkiri, ndi si na Galili soro Jisus, nējere Ya ozi: 56 n'etiti ha ka Meri Magdalini, na Meri nne Jemes na Joses, na nne umu Zebedi, nọ. 57 Ma mb͕e o ruru anyasi, otù ọgaranya, aha-ya bu Josef, onye ya onwe-ya bu kwa onye nēso uzọ Jisus, si n'Arimatia bia: 58 nwoke a jekuru Pailat, riọ aru Jisus. Mb͕e ahu Pailat nyere iwu ka ewere ya nye n'aka-ya. 59 Josef we būru aru ahu, ke ya n'ezi ákwà ọcha nēnwu enwu, 60 tọb͕ọ ya n'ílì ọhu nke aka ya, nke o gwuwarari n'oké nkume: o we kpọre otù nkume uku kwachie ọnu-uzọ ílì ahu, we la. 61 Ma Meri Magdalini na Meri ọzọ nọ n'ebe ahu, nānọdu na ncherita-iru ílì ahu. 62 Ma n'echi-ya, nke bu ubọchi so ubọchi Nkwadebe, ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi zukọrọ jekuru Pailat, 63 si, Onye-nwe-ayi, ayi chetara na Onye-nduhie ahu siri, mb͕e Ọ nọ na ndu, Mb͕e ubọchi atọ gasiri M'gēsi n'ọnwu bilie. 64 Ya mere, nye iwu ka emechie ílì ahu si-ike rue ubọchi nke-atọ, ka ndi nēso uzọ-Ya ghara ibia zuru Ya la ma eleghi anya, we si ndi-Ju, Emere ka O si na ndi nwuru anwu bilie: njehie ikpe-azu a gājọ kwa njọ kari nke-mbu. 65 Pailat siri ha, Unu nwere òtù ndi-nche: labanu, mechienu ya si-ike, dika unu matara. 66 Ha we ga, mechie ílì ahu si-ike, n'ika akàrà na nkume ahu, ha na òtù ndi-nche ahu yikọrọ.

Matiu 28

1 Ma mb͕e ubọchi-izu-ike nāgwu, mb͕e chi ubọchi mbu n'ízù ubọchi asa nābọ, Meri Magdalini na Meri ọzọ biara ile ílì ahu. 2 Ma le, ala-ọma-jijiji uku dara; n'ihi na mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi si n'elu-igwe ridata, bia rue, bupu nkume ahu, we nọkwasi ya. 3 Oyiyi-ya di ka àmùmà, uwe-ya nācha kwa ucha dika snow: 4 site n'egwu ya ndi-nche mara jijiji, bia di ka ndi nwuru anwu. 5 Ma mọ-ozi ahu zara, si ndinyom ahu, Unu onwe-unu atula egwu: n'ihi na amatawom na unu nāchọ Jisus, Onye akpọgideworo n'obe. 6 Ọ nọghi n'ebe a; n'ihi na emere ka O si n'ọnwu bilie, dika O kwuru. Bianu, le ebe Ọ tọb͕ọrọ. 7 Ga-kwa-nu ọsọsọ, si ndi nēso uzọ-Ya, Emere ka O si na ndi nwuru anwu bilie; ma le, O buru unu uzọ ga Galili; n'ebe ahu ka unu gāhu Ya: le, agwawom unu. 8 Ha we were egwu na oké ọṅù la ọsọsọ site n'ílì ahu, b͕a kwa ọsọ ikọrọ ndi nēso uzọ-Ya akukọ a. 9 Ma le, Jisus zutere ha, si, Ṅurianu ọṅu. Ha we bia jide ukwu-Ya abua, kpọ isi ala nye Ya. 10 Mb͕e ahu Jisus si ha, Unu atula egwu: jenu kọrọ umu-nnam ka ha je Galili, n'ebe ahu ka ha gāhukwam. 11 Ma mb͕e ha nāga, le, ufọdu nime òtù ndi-nche batara n'obodo ahu, kọrọ ndi-isi-nchu-àjà ihe nile mere. 12 Mb͕e ha na ndi-okenye zukọrọ, b͕a kwa ìzù, ha we nye ndi-agha ahu ego riri nne, 13 si, Sinu, Ndi nēso uzọ-Ya biara n'abali, zuru Ya n'ori mb͕e ayi nāraru ura. 14 Ọ buru kwa na nka ruru nti onye-isi, ayi onwe-ayi gārafu ya, me ka unu ghara icheb͕u onwe-unu. 15 Ha we nara ego ahu, me dika eziri ha: ewe b͕asa okwu a n'etiti ndi-Ju, rue ta. 16 Ma ndikom iri na otù ahu ndi nēso uzọ-Ya gara Galili, rue ugwu ebe Jisus gwara ha. 17 Mb͕e ha huru Ya, ha we kpọ isi ala nye Ya: ma ufọdu nwere obi abua. 18 Jisus we biakute ha, gwa ha okwu, si, Ewerewo ike nile di n'elu-igwe na n'elu uwa nyem. 19 Ya mere, ganu, me mba nile ka ha buru ndi nēso uzọm, nēme ha baptism bà n'aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mọ Nsọ: 20 nēzí ha ka ha debe ihe nile, ka ha ra, bú nke M'nyere unu n'iwu: ma le, Mu onwem nọyere unu ubọchi nile, rue ọgwugwu oge a.

Mak 1

1 Nmalite ozi ọma jisus Kraist, Ọkpara Chineke. 2 Dika edeworo ya n'akwukwọ Aisaia onye-amuma, si, Le, Mu onwem nēzipu onye-ozim ka ọ ga n'iru gi, Onye gēmezi uzọ-gi; 3 Olu otù onye nēti nkpu n'ọhia, si, Dozienu uzọ Onye-nwe-ayi, Me okporo-uzọ-Ya ka ha guzozie; 4 Jọn putara ìhè, onye nēme baptism n'ọhia, nēkwusa kwa baptism nchèghari inwe nb͕aghara nmehie. 5 Ala Judia nile na ndi Jerusalem nile nāpukuru ya; ọ neme kwa ha baptism n'osimiri Jọdan, ha nēkwuputa nmehie nile ha. 6 Jọn nēyi aji camel, nēke kwa akpukpọ-ọkiké n'úkwù-ya, nēri kwa igurube na manu-aṅu nke ọhia. 7 Ọ nēkwusa kwa, si, Onye kam ike nābia n'azum, Onye m'nērughi iruru ala itọpu eriri akpukpọ-ukwu-Ya abua. 8 Mu onwem jiri miri me unu baptism; ma Onye ahu geji Mọ Nsọ me unu baptism. 9 O rue na mb͕e ahu, Jisus siri na Nazaret nke Galili bia, Jọn we mee Ya baptism nime Jọdan. 10 Ngwa ngwa mb͕e O si na miri nārigo, Ọ huru elu-igwe ka ha nādọwa, Ọ hu-kwa-ra Mọ Nsọ dika nduru ka Ọ nēfedakwasi Ya: 11 olu we si n'elu-igwe ahu da, si, Gi onwe-gi bu Ọkparam M'huru n'anya, ihe-Gi dim ezi nma. 12 Ngwa ngwa Mọ Nsọ we chua Ya ba n'ọhia. 13 O we nọ n'ọhia ọgu ubọchi abua, Setan nānwa Ya; Ya na anu ọhia nile nọ kwa; ndi-mọ-ozi nēje-kwa-ra Ya ozi. 14 Ma mb͕e arasiiri Jọn nye, Jisus biara na Galili, nēkwusa ozi ọma Chineke, 15 si, Oge ezuwo, ala-eze Chineke di kwa nso: chègharianu, kwe-kwa-nu n'ozi ọma. 16 Mb͕e Ọ nāga n'usọ oké osimiri Galili, O we hu Saimon na Andru nwa-nne Saimon ka ha nāwuye úb͕ú n'oké osimiri: n'ihi na ha bu ndi-ọkù. 17 Jisus we si ha, Bianu som n'azu, M'gēme kwa ka unu buru ndi-ọkù nākuta madu. 18 Ngwa ngwa ha we rapu ihe nile ha ji eb͕u azù, so Ya. 19 Mb͕e Ọ gara n'iru nke-ntà, O we hu Jemes nwa Zebedi, na Jọn nwa-nne-ya, ndi nọ kwa n'ub͕ọ, nēkezi ihe ha ji eb͕u azù. 20 Ngwa ngwa O we kpọ ha: ha we rapu nna-ha Zebedi n'ub͕o, ya na ndi-ọlu egoro ego, ha je so Ya n'azu. 21 Ha we ga ba na Kapanaum; ngwa ngwa O we ba n'ulo-nzukọ-ha n'ubọchi-izu-ike we nēzí ihe. 22 Ibobo ozizí-Ya we nwua ha n'aru: n'ihi na Ọ nēzí ha ihe dika O nwere ike, ọ bughi kwa dika ndi-ode-akwukwọ. 23 Ngwa ngwa nwoke nke di n'aka mọ nādighi ọcha we nọ n'ulo-nzukọ-ha; o we tisie nkpu ike, 24 si, Gini ka ayi na Gi nwekọrọ, Jisus Onye Nazaret? Ì biara ila ayi n'iyì? Amataram gi Onye I bu, Onye Nsọ ahu nke Chineke. 25 Jisus we bara ya nba, si, Kpuchie ọnu-gi, si kwa nime ya puta. 26 Mọ ahu nādighi ọcha we se ya, were kwa oké olu kpọ nkpu, we si nime ya puta. 27 Ibobo we nwua ha nile n'aru, nke mere ka ha jurita onwe-ha, si, Gini bu nka? ozizí ọhu! ọ bu n'ike ka Ọ nēnye ọbuná ndi-mọ nādighi ọcha iwu, ha nāṅa kwa Ya nti. 28 Ngwa ngwa ewe kọsa akukọ-Ya ebe nile n'ala dum di Galili gburugburu. 29 Ngwa ngwa, mb͕e ha putasiri n'ulo-nzukọ ahu, ha we ba n'ulo Saimon na Andru, ha na Jemes na Jọn. 30 Ma nne nwunye Saimon nēdina n'aru-ọku; ngwa ngwa ha we gwa Ya okwu bayere nwanyi ahu: 31 O we jekuru ya, jide ya n'aka, palie ya; aru-ọku ahu we rapu ya, ọ nējere ha ozi. 32 Ma mb͕e o ruru anyasi, mb͕e anyanwu dara, ha nēkutara Ya ndi aru nādighi nma, na ndi mọ ọjọ ji 33 Obodo ahu dum we zukọ n'ọnu-uzọ. 34 O we me ka aru ọtutu madu di ike, bú ndi aru nādighi nma n'ọria di iche iche, Ọ chupu kwa ọtutu ndi-mọ ọjọ; O kweghi kwa ndi-mọ ọjọ kwue okwu, n'ihi na ha matara Ya. 35 O we bilie n'isi-ututu, n'ezi abali, pua, je n'ebe bu ọhia, nọ nēkpe ekpere n'ebe ahu. 36 Saimon na ndi ya na ha nọ we b͕aso Ya; 37 ha we chọta Ya, si Ya, Madu nile nāchọ Gi. 38 O we si ha, Ka ayi ga ebe ọzọ n'obodo nile so nka, ka M'kwusa kwa n'ebe ahu; n'ihi na ọ bu ime nka ka M'putara. 39 O we ba n'ulo-nzukọ nile ha gazue na Galili dum, nēkwusa ozi ọma nāchupu kwa ndi-mọ ọjọ. 40 Onye-ekpenta we biakute Ya, nāriọ Ya, nēb͕u-kwa-ra Ya ikperè, nāsi kwa Ya, Ọ buru na I nāchọ, I puru ime ka m'di ocha. 41 O we nwe ọmiko, setipu aka-Ya, metu ya, si ya, Anamachọ; ka eme ka i di ọcha. 42 Ngwa ngwa ekpenta ahu we rapu ya, eme kwa ka ọ di ọcha. 43 O we dọ ya aka na nti nke-uku, we chupu ya ngwa ngwa, 44 si ya, Lezi anya ka i ghara igwa onye ọ bula okwu ọ bula: ma laba, were onwe-gi gosi onye-nchu-àjà, che kwa n'iru Chineke ihe bayere ime gi ka i di ọcha nke Moses nyere n'iwu, ka ọ buru ha àmà. 45 Ma ọ puru, malite ikwusazu ya, na ifesa okwu ahu, nke mere na O nweghi ike ọzọ ibà nime obodo n'iru ọra, kama Ọ nọ n'azu obodo n'ebe bu ọhia: ha we si n'ebe nile nābiakute Ya.

Mak 2

1 Mb͕e Ọ batara ọzọ na Kapanaum mb͕e ubọchi ufọdu gasiri, ewe nu na Ọ nọ nime ulo. 2 Otutu madu we zukọ, nke mere na uzọ adighi ọzọ, é-è, ọbuná n'ọnu-uzọ: Ọ nāgwa kwa ha okwu Chineke. 3 Ha we bia, kutara Ya otù onye akuku-aru-ya nwuru anwu, nke madu anọ nēbu. 4 Mb͕e ha apughi ikuru ya biakute Ya n'ihi ìgwè madu, ha we kpupu elu ulo ebe Ọ nọ: mb͕e ha gwupusiri ya, ha we buda ute nke onye akuku-aru-ya nwuru anwu nēdina. 5 Mb͕e Jisus huru okwukwe-ha Ọ si onye ahu akuku-aru-ya nwuru anwu, Nwa, anāb͕aghara gi nmehie-gi nile. 6 Ma ufọdu n'etiti ndi-ode-akwukwọ nānọdu ala n'ebe ahu, nātule kwa okwu n'obi-ha, 7 si, Gini mere Nwoke a nēkwu okwu otú a? Ọ nēkwulu Chineke: ònye puru ib͕aghara nmehie, ma-ọbughi otù Onye, bú Chineke? 8 Ngwa ngwa ebe Jisus mazuru nime mọ-Ya na ha nātule okwu nime onwe-ha otú a, Ọ si ha, Gini mere unu nātule ihe ndia n'obi-unu? 9 Òle nke ka nfe, isi onye akuku-aru-ya nwuru anwu, Anāb͕aghara gi nmehie-gi nile; ma-ọbu isi, Bilie, chiri ute-gi, jeghari kwa? 10 Ma ka unu we mata na Nwa nke madu nwere ike n'elu uwa ib͕aghara nmehie, (Ọ si onye ahu akuku-aru-ya nwuru anwu), 11 M'si gi, Bilie, chiri ute-gi, la n'ulo-gi. 12 O we bilie, chiri ute-ya ngwa ngwa, pua n'iru ha nile; nke mere ka ibobo nwua ha nile n'aru, ha we to Chineke, si, Ọ dighi mb͕e ọ bula ayi huru ya otú a. 13 O we pua ọzọ ga n'usọ oké osimiri; ìgwè madu ahu nile we nābiakute Ya, Ọ nēzí kwa ha ihe. 14 Mb͕e Ọ nāga, Ọ hu Livai nwa Alfiọs, ka ọ nọduru n'ulọ-ùtú, Ọ si ya, Som. O we bilie, so Ya 15 O rue, na Ọ nọduru na nri n'ulo-ya, ọtutu ndi ọna-utu na ndi-nmehie so-kwa-ra Jisus na ndi nēso uzọ-Ya nọdu na nri: n'ihi na ha di ọtutu, ha nēso kwa Ya. 16 Mb͕e ndi-ode-akwukwọ di n'etiti ndi-Farisi huru na O nēso ndi-nmehie na ndi-ọna-utu ahu eri ihe, ha we si ndi nēso uzọ-Ya, Gini mere Ọ nēso ndi-ọna-utu na ndi-nmehie ahu eri ihe? 17 Mb͕e Jisus nuru ya, Ọ si ha, Nkpà dibia akpaghi ndi di ike, kama ọ nākpa ndi aru nādighi nma: abiaghm ikpọ ndi ezi omume, kama ọ bu ndi-nmehie. 18 Ndi nēso uzọ Jọn na ndi-Farisi nēbu kwa ọnu: ha we bia, si Ya, N'ìhi gini ka ndi nēso uzọ Jọn na ndi nēso uzọ ndi-Farisi nebu ọnu, ma ndi nēso uzọ-Gi adighi-ebu ọnu? 19 Jisus we si ha, Umu-ndikom nke ulo anālu nwunye ọhu, ọ̀ gābu na ha puru ibū ọnu mb͕e ha na Onye nālu nwunye ọhu nānọ? ka oge ra ha na Onye nālu nwunye ọhu nānọ ha apughi ibū ọnu. 20 Ma ubọchi gābia, mb͕e agānapu ha Onye nālu nwunye ohu, mb͕e ahu ka ha gēbu kwa ọnu n'ubọchi ahu. 21 Ọ dighi onye ọ bula nēwere iberibe ákwà ọb͕ub͕a ọhu dukọta n'uwe ochie: eme otú a, nke kwesiri imechi ya nādọkapu ihe n'aru-ya, nke-ọhu nādọkapu n'aru nke-ochie, ndọka jọkariri njọ aputa. 22 Ọ dighi kwa onye ọ bula nāb͕aye manya-vine ọhu na karama-akpukpọ ochie: eme otú a, manya-vine gāb͕awa karama-akpukpọ ahu, manya-vine na karama-akpukpọ ala kwa n'iyì: ma anāb͕aye manya-vine ọhu na karama-akpukpọ ọhu. 23 O rue, na Ọ nāga n'etiti ubi ọka n'ubọchi-izu-ike; ndi nēso uzọ-Ya we malite ighọ oko ọka mb͕e ha nāga. 24 Ndi-Farisi we si Ya, Le, gini mere ha nēme n'ubọchi-izu-ike ihe nēzighi ezi n'iwu? 25 O we si ha, Ọ dighi mb͕e ọ bula unu guru ihe Devid mere, mb͕e ọ nọ na nkpà, mb͕e agu gu-kwa-ra ya, ya onwe-ya, na ndi soro ya? 26 Otú ọ batara n'ulo Chineke mb͕e Abaiata bu onye-isi-nchu-àjà, rie ob͕e achicha anēche n'iru Chineke, nke nēzighi ezi n'iwu ka erie, kama ọ bu nání ndi-nchu-àjà ka o ziri ezi, o we nye kwa ndi ya na ha yikọ? 27 O we si ha, Emere ubọchi-izu-ike n'ihi madu, emeghi madu n'ihi ubọchi-izu-ike: 28 ya mere Nwa nke madu ji buru kwa Onye-nwe ubọchi-izu-ike.

Mak 3

1 I bà-kwa-ra ọzọ n'ulo-nzukọ-ha; otù nwoke nọ kwa n'ebe ahu nke aka-ya kpọnwuru akpọnwu. 2 Ha we nēche Ya, ma Ọ gēme ka aru-ya di ike n'ubọchi-izu-ike; ka ha we bo Ya ebubo. 3 O we si nwoke ahu aka-ya kpọnwuru akpọnwu, Bilie, puta n'etiti. 4 O we si ha, Ò ziri ezi n'iwu ime ezi ihe, ma-ọbu ime ihe ọjọ, n'ubọchi-izu-ike? ìzọputa ndu, ma-ọbu ib͕u eb͕u? Ma ha kpuchiri ọnu-ha. 5 Mb͕e O lesiri ha anya gburugburu n'iwe, ebe ọ nēwuta Ya nke-uku, bú na anēme ka obi-ha ma etili, O we si nwoke ahu, Setipu aka-gi. O we setipu ya: ewe me ka aka-ya di ka ọ di mbu. 6 Ndi-Farisi we pua, ngwa ngwa ha na ndi Herod we b͕a ìzù megide Ya, ka ha gēsi la Ya n'iyì. 7 Jisus we wezuga Onwe-ya, Ya na ndi nēso uzọ-Ya, je oké osimiri: oké ọtutu madu si na Galili soro: oké ọtutu madu si kwa na Judia, 8 si kwa na Jerusalem, si kwa n'Aidumia, na ofè Jọdan, na buruburu Taia na Saidon, biakute Ya, mb͕e ha nuru ihe nile Ọ nēme, ka ha ra. 9 O we gwa ndi nēso uzọ-Ya okwu, ka otù ub͕o ntà di nēche Ya n'ihi ìgwè madu ahu, ka ha ghara ikpab͕u Ya: 10 n'ihi na O mereri ka aru ọtutu madu di ike; ya mere na ha dagidere Ya ka ha metu Ya aka, ka ha ra, bú ndi ajọ ọria di iche iche di n'aru. 11 Ọzọ, mb͕e ọbula ndi-mọ nādighi ọcha lere Ya anya, ha nāda n'ala n'iru Ya, nēti nkpu, si, Gi onwe-gi bu Ọkpara Chineke. 12 Ọ nābasi-kwa-ra ha nba ike, ka ha ghara ime ka Ọ puta ìhè. 13 O we rigo n'ugwu ahu, kpọ ha biakute Ya, bú ndi Ya onwe-ya chọrọ: ha we jekuru Ya. 14 O we me ndikom iri na abua, ka Ya na ha we biri, ka O we nēzipu kwa ha ikwusa ozi ọma, 15 na inwe ike ichupu ndi-mọ ọjọ: 16 Saimon ka O nyekwasiri aha Pita; 17 na Jemes nwa Zebedi, na Jọn nwa-nne Jemes; ha ka O nyekwasiri aha Boanajis, nke bu, Umu éb͕è-elu-igwe: 18 na Andru, na Filip, na Batọlọmiu, na Matiu, na Tomas, na Jemes nwa Alfiọs, na Tadiọs, na Saimon Kananaiọs, 19 na Judas Iskariot, onye ra-kwa-ra Ya nye. O we ba n'ulo. 20 Ìgwè madu we b͕akọ ọzọ, ya mere na ha apughi ọbuná iri nri. 21 Mb͕e ndi-ikwu-Ya nuru ya, ha we pua ijide Ya: n'ihi na ha nāsi, Anya adighi Ya nma. 22 Ndi-ode-akwukwọ ndi si na Jerusalem ridata we si, O nwere Beelzebul; ha si kwa, N'ike onye-isi ndi-mọ ọjọ ka Ọ nāchupu ndi-mọ ọjọ. 23 O we kpọ ha biakute Ya, si ha n'ilu di iche iche, Sètan Si aṅa pu ichupu Setan? 24 Ọzọ, ọ buru na ala-eze ekewa megide onwe-ya, ala-eze ahu apughi iguzo. 25 Ọ buru kwa na èzí-na-ulo ekewa megide onwe-ya, èzí-na-ulo ahu agaghi-apu iguzo. 26 Ọ buru kwa na Setan ebiliwo megide onwe-ya, we kewa, ọ pughi iguzo, kama o nwere ọgwugwu. 27 Ma ọ dighi onye ọ bula puru ibà n'ulo onye di ike, na ipunara ya ihe-ya nile, ma ọ buru na o bughi uzọ ke onye ahu di ike ab͕u; mb͕e ahu ọ gāpunara kwa ya ihe di n'ulo-ya. 28 N'ezie asim unu, Na agāb͕aghara umu madu nmehie-ha nile, na nkwulu-ha, ka ha ra, bú nke ha gēji kwulu: 29 ma onye ọ bula nke gēkwulu Mọ Nsọ enweghi nb͕aghara rue mb͕e ebighi-ebi, ma nmehie ebighi-ebi nātuhi ya: 30 n'ihi na ha nāsi, O nwere mọ nādighi ọcha. 31 Nne-Ya na umu-nne-Ya abia kwa; ha we guzo n'èzí, zigara Ya ozi, nākpọ Ya. 32 Ìgwè madu nānọ kwa Ya buruburu; ha we si Ya, Le, nne-Gi na umu-nne-Gi nọ n'èzí nāchọ Gi. 33 O we za ha, si, Ònye bu nnem na umu-nnem? 34 Mb͕e O lesiri ha anya buruburu, bú ndi nọ Ya buruburu, Ọ si, Le, nnem na umu-nnem! 35 N'ihi na onye ọ bula nke gēme ihe Chineke nāchọ, onye ahu bu nwa-nnem nwoke, na nwa-nnem nwanyi, na nnem.

Mak 4

1 Ọ we malite ọzọ izí ihe n'usọ oké osimiri. Oké ìgwè madu uku we zukọ n'ebe Ọ nọ, ya mere Ọ batara n'ub͕o, we nọdu ala n'osimiri; ìgwè madu ahu nile we nọ n'usọ oké osimiri n'elu ala. 2 O we zí ha ọtutu ihe n'ilu di iche iche, si ha n'ozizí-Ya, 3 Nurunu: Le, ọgha-nkpuru puru ka ọ gha nkpuru: 4 o rue, mb͕e ọ nāgha, ufọdu dara n'akuku uzọ, anu-ufe we bia tuturie ha. 5 Nkpuru ọzọ we da n'ala nkume, ebe ha nēnweghi ájá ri nne; ngwa ngwa ha we pulite, n'ihi na ha enweghi ájá di omimi: 6 ma mb͕e anyanwu wara, ha chanwua; ha we kpọnwua, n'ihi na ha enweghi nkpọrọgwu. 7 Nkpuru ọzọ we da n'etiti ogwu, ogwu ahu we tolite, kpab͕ue ha, ha amighi kwa nkpuru. 8 Nkpuru ọzọ we da n'ala di nma, ha we nāmi nkpuru, nētó nāba kwa uba; ha we mia, otù orú na iri, ọzọ ọgu atọ, ọzọ ọgu ise. 9 O we si, Onye nwere nti inu ihe, ya nu. 10 Mb͕e nání Ya nọ, ndi nọ Ya buruburu na ndikom iri na abua ahu we jua Ya ilu ahu. 11 O we si ha, Ọ bu unu ka enyeworo ihe-omimi ala-eze Chineke: ma anēmere ndi nọ n'èzí ihe nile n'ilu: 12 ka ha we hu n'ọhuhu, ghara ihuta; ka ha we nu kwa n'ọnunu, ghara inuta; ka ha ghara ichighari mb͕e ọ bula, ewe gb͕aghara ha. 13 O we si ha, Ùnu amataghi ilu a? ùnu gēsi kwa aṅa mara ilum nile? 14 Ọgha-nkpuru nāgha okwu Chineke. 15 Ma ndia bu ndi nọ n'akuku uzọ ahu, ebe anāgha okwu ahu; ma mb͕e ọ bula ha nuru, ngwa ngwa Setan abia, we napu okwu nke aghaworo nime ha. 16 Otú ahu, ndia bu kwa ndi anāgha n'ebe nkume ahu, ndi, mb͕e ọ bula ha nuru okwu ahu, ngwa ngwa ha were ọṅù jide ya; 17 ma ha enweghi nkpọrọgwu nime onwe-ha, kama ha nānọ nwa oge; emesia, mb͕e nkpab͕u ma-ọbu nsob͕u putara n'ihi okwu ahu, ngwa ngwa ha ma n'ọnyà. 18 Ndi ọzọ bu kwa ndi anāgha n'etiti ogwu ahu; ndia bu ndi nuru okwu ahu, 19 ma ncheb͕u nile nke oge a, na aghughọ nke àkù, na nbata nke agu ihe di iche iche ọzọ, nākpab͕u okwu ahu, o we ghọ ihe nāmighi nkpuru. 20 Ndi ahu bu kwa ndi aghara n'ala ahu di nma; ndi ọ bula ndi nānu okwu ahu, we nara ya, we mia nkpuru, otù orú na iri, ọzọ ọgu atọ, ọzọ ọgu ise. 21 O we si ha, Ànēbute oriọna ka adọba ya n'okpuru mb͕é', ma-ọbu n'okpuru ihe-ndina? ọ̀ bughi ka adọba ya n'elu ihe-idọba-oriọna? 22 N'ihi na ọ dighi ihe ezoro ezo, ma-ọbughi ka ewe me ka ọ puta ìhè; ọ dighi kwa ihe emere ka ọ buru ihe ezoro ezo, kama ọ bu ka o we puta ìhè. 23 Ọ buru na onye ọ bula nwere nti inu ihe, ya nu. 24 O we si ha, Lezienu anya ihe unu nānu: ihe unu ji tù ihe ka agēji tùru unu: agēnye kari kwa unu. 25 N'ihi na onye nwere, onye ahu ka agēnye: onye nēnweghi kwa, ọbuná ihe o nwere ka agānapu ya. 26 O we si, ọ bu otu a ka ala-eze Chineke di, ọ di ka mb͕e madu tupuru nkpuru n'ala; 27 we raru ura teta kwa abali na ehihie, nkpuru ahu we pue tó kwa, onye ahu amaghi ka o si me. 28 Ala nāmi nkpuru site n'onwe-ya; mbu npute, emesia oko, emesia ọka kara aka n'oko. 29 Ma mb͕e ọ bula nkpuru chara, ngwa ngwa o were mma-iwe-ihe-ubi webe, n'ihi na mb͕e owuwe-ihe-ubi abiawo. 30 O we si, Ayi gēsi aṅa tunyere ala-eze Chineke? ma-ọbu n'ìlu gini ka ayi gātu ya? 31 Ọ di ka nkpuru mustard, nke, mb͕e ọ bula aghara ya n'ala, ọ bu ezie na ọ di ntà kari nkpuru nile di n'ala; 32 ma mb͕e ọ bula aghara ya, o tó, ghọ ihe bùkari ihe nile anāku n'ubi, o we waputa oké alaka; nke mere ka anu-ufe nile nke elu-igwe pu inọ n'okpuru ǹdò-ya. 33 O nēji kwa ọtutu ilu di otú a gwa ha okwu Chineke, dika ha puru inu ya: 34 ma asi na O jighi ilu Ọ dighi-agwa ha okwu: ma mb͕e Ya na ha nọ iche Ọ nākọrọ ndi nke Ya nēso uzọ-Ya ihe nile. 35 N'ubọchi ahu, mb͕e o ruru anyasi, O we si ha, Ka ayi gabiga n'ofè ọzọ. 36 Ha we rapu ìgwè madu ahu, we kuru Ya, otú di, tiyere onwe-ha n'ub͕ọ ahu. Ub͕ọ ufọdu ọzọ di kwa nke nēso Ya. 37 Oké ajọ ifufe we fe, ebili-miri we nāwubà n'ub͕o ahu, ya mere na miri nēju n'ub͕ọ ub͕u a. 38 Ma Ya onwe-ya nọ n'isi ub͕ọ, nāraru ura n'elu ohiri-isi: ha we kpọte Ya, Si Ya, Onye-ozizí, Ò metughi Gi n'obi na ayi nāla n'iyì? 39 O we teta, bara ifufe nba, si kwa oké osimiri, Di jū, kpuchie ọnu-gi. Ifufe we febìe, oké ndaju we di. 40 O we si ha, Gini mere unu nātu ujọ? ùnu akēnweghi okwukwe? 41 Ha we tua oké egwu, sirita onwe-ha, Ònye bu kwa onye a, na ọbuná ifufe na oké osimiri nāṅa Ya nti?

Mak 5

1 Ha we bia rue ofè ọzọ nke oké osimiri ahu, n'ala ndi Gerasa. 2 Mbe Ọ putasiri n'ub͕ọ, ngwa ngwa nwoke nke di n'aka mọ nādighi ọcha we si n'ebe anēlì ozu zute Ya, 3 nwoke ahu nwere ebe-obibi-ya n'ebe ahu anēlì ozu: ọ dighi kwa onye ọ bula puru ike ya ab͕u ọzọ, ọbuná ma ewere nkpọrọ; 4 n'ihi na ewereri nkpọrọ-ukwu na nkpọrọ ke ya ọtutu mb͕e, o we nyajipusia nkpọrọ nile, kujisia nkpọrọ-ukwu nile: ọ dighi kwa onye ọ bula di ike imeju ya anya. 5 Mb͕e nile, abali na ehihie, o nēti kwa nkpu, were kwa nkume nēyikasi onwe-ya, n'ebe anēlì ozu na n'ugwu. 6 Mb͕e ọ huru Jisus n'ebe di anya, o we b͕a ọsọ, kpọ isi ala nye Ya; 7 mb͕e o tisiri nkpu n'oké olu, o we si, Gini ka mu na Gi nwekọrọ, Jisus, Ọkpara Chineke Nke kachasi ihe nile elu? Ewerem Chineke b͕a Gi iyi, emekpalam aru. 8 N'ihi na Ọ nāsi ya, Si nime nwoke a puta, gi mọ nādighi ọcha. 9 O we jua ya, Òle aha-gi? Ọ si Ya, Aham bu Legion; n'ihi na ayi di ọtutu. 10 Ọ we riọsie Ya ike ka Ọ ghara izipu ha n'ala ahu. 11 Ma oké ìgwè ezì di n'ebe ahu na nso ugwu ahu nāta nri. 12 Ha we riọ Ya, si, Ziga ayi nime ìgwè ezì ahu, ka ayi we ba nime ha. 13 O we kwere ha. Ndi-mọ ahu nādighi ọcha we puta, je ba n'ìgwè ezì ahu: ìgwè ezì we nudà n'ebe ahu di nkputankpu dabà n'oké osimiri, ha ruru dika nnù ise; miri we b͕ab͕ue ha. 14 Ndi nāzù ha we b͕alaga, kọsa ya n'obodo ahu na n'ubi. Ha we bia ihu ihe ọ bu, bú nke emereri. 15 Ha we biakute Jisus, le onye ahu ndi-mọ ọjọ ji ka ọ nọduru ala, yiri uwe, uche-ya zu-kwa-ra okè, bú onye nwere legion ahu: ha we tua egwu. 16 Ndi huru ya we kọrọ ha otú emere onye ahu ndi-mọ ọjọ ji, na okwu ìgwè ezì ahu. 17 Ha we malite iriọ Ya ka Ọ pua n'ókè-ala-ha. 18 Mb͕e Ọ nābà nime ub͕ọ, onye ahu ndi-mọ ọjọ jiri na mbu we riọ Ya ka ya na Ya biri. 19 Ma O kweghi ya, kama Ọ si ya, La n'ulo-gi, lakuru ndi nke gi, kọrọ ha ihe nile, ka ha ra, bú nke Onye-nwe-ayí meworo gi, na otú O mere gi ebere. 20 O we je, malite ikwusa na Dekapọlis ihe Jisus mere ya, ka ha ra: o we ju madu nile anya. 21 Mb͕e Jisus gasiri ọzọ n'ub͕ọ ahu n'ofè ọzọ, oké ìgwè madu we zukọ n'ebe Ọ nọ: O we nọ n'usọ oké osimiri. 22 Otù nime ndi-isi ulo-nzukọ, aha-ya bu Jeairọs, we bia; mb͕e ọ huru Ya, o we da n'ala n'ukwu-Ya, 23 we riọsie Ya ike, si, Nwam nwanyi ntà nānwunyu anya: ariọm I ka I bia bikwasi ya aka-Gi abua, ka ewe zọputa ya, o we di ndu. 24 O we so ya je; oké ìgwè madu we nēso Ya, ha nākpab͕u kwa Ya. 25 Otù nwanyi, nke nwere orùrù-ọbara arọ iri na abua, 26 nke hu-kwa-rari ọtutu ahuhu n'aka ọtutu dibia, mefusia ihe nile o nwere, ma ọ baghi ya urù ọ bula, kama ọ jọkaria ya njọ, 27 ebe ọ nuru ihe nile banyere Jisus, o we bia n'azu Ya n'etiti ìgwè madu ahu, we metu uwe-Ya aka. 28 N'ihi na ọ nāsi, Ọ buru na emetum nání uwe-Ya aka, agāzọputam. 29 Ngwa ngwa isi ọbara-ya kọsia; o we mara n'aru-ya na emere ya ka aru di ya ike n'ajọ ọria ahu. 30 Ngwa ngwa, ebe Jisus mazuru na ike nke nēsi nime Ya puta apuwori, O chigharia n'ìgwè madu ahu, we si, Ònye meturu uwem aka? 31 Ndi nēso uzọ-Ya we si Ya, I huwo ìgwè madu a ka ha nākpab͕u Gi, I nāsi kwa, Ònye meturum aka? 32 O we le anya gburugburu ka Ọ hu nwanyi nke mere ihe a. 33 Ma nwanyi ahu, ebe ọ matara ihe emere ya-ri, ọ tua egwu, ma kwa jijiji, bia da n'iru Ya, gwa Ya ezi-okwu nile. 34 Ma Ọ siri ya, Nwam nwanyi, okwukwe-gi azọputawo gi; la n'udo, si n'ajọ ọria-gi nwe aru di ike. 35 Mb͕e Ọ kpu okwu n'ọnu, ha si n'ulo onye-isi ulo-nzukọ ahu bia, si, Nwa-gi nwanyi anwuruwo: gini mere i nēsob͕u Onye-ozizí a ọzọ kwa? 36 Ma Jisus aṅaghi nti n'okwu anēkwu, Ọ si onye-isi ulo-nzukọ ahu, Atula egwu, kwere nání. 37 O kweghi kwa onye ọ bula so Ya je, ma-ọbughi Pita, na Jemes, na Jọn nwa-nne Jemes. 38 Ha we bia ulo onye-isi ulo-nzukọ ahu; O we hu ùzù, na ọtutu madu ka ha nākwa ákwá nēti kwa nkpu nke-uku. 39 Mb͕e Ọ batasiri, O we si ha, Gini mere unu nātu ùzù, nākwa kwa ákwá? nwatakiri ahu anwughi anwu, kama ọ nāraru ura. 40 Ha we chìa Ya ọchì. Ma mb͕e Ọ chupusiri ha nile, Ọ kuru nna nwatakiri ahu na nne-ya na ndi Ya na ha yikọ, we ba n'ebe nwatakiri ahu di. 41 O we jide nwatakiri ahu n'aka, si ya, Talita kumi; nke bu, ma asugharia ya, Nwa-ab͕ọghọ ntà, asim i, Bilie. 42 Ngwa ngwa nwa-ab͕ọghọ ntà ahu we bilie, jeghari kwa; n'ihi na ọ b͕ara arọ iri na abua. Ngwa ngwa ibobo we nwubiga ha nile ókè n'aru 43 O we gwasie ha ike ka onye ọ bula ghara imara nka: O we si ka enye ya ihe-oriri.

Mak 6

1 O we si n'ebe ahu pua; O we bia n'ala nke aka Ya; ndi nēso uzọ-Ya so kwa Ya. 2 Mb͕e ubọchi-izu-ike ruru, O we malite izi ihe n'ulo-nzukọ-ha: mb͕e ha nuru Ya ibobo we nwua ọra madu n'aru, ha si, Òle ebe ka Nwoke a nwere ihe ndia? ha si kwa, Gini bu amam-ihe enyere Nwoke a? òle isi ọlu ike di otú a aluru n'aka-Ya? 3 Nwoke a, Ọ̀ bughi onye-ọ̀kà ahu, nwa Meri, na nwa-nne Jemes, na Joses, na Judas, na Saimon? umu-nne-Ya ndinyom, hà anọghi kwa n'ebe a n'etiti ayi? Ewe me ka ha ma n'ọnyà n'aru Ya. 4 Jisus we si ha, Onye-amuma abughi onye adighi-asọpuru, ma-ọbughi n'ala nke aka ya, na n'etiti ikwu-ya, na n'ulo-ya. 5 Ọ pughi kwa ilu ọlu di ike ọ bula n'ebe ahu, ma-ọbughi na O bikwasiri ndi-nriaria ole-na-ole aka-Ya abua, we me ka aru di ha ike. 6 Ekweghi-ekwe-ha we ju Ya anya. Ọ nējeghari kwa obodo ntà nile ha buruburu nēzí ihe. 7 Ọ we kpọ ndi-ozi iri na abua ahu biakute Ya, O we malite izipu ha abua abua; O nye-kwa-ra ha ike n'ebe ndi-mọ nādighi ọcha nọ; 8 O we nye ha iwu ka ha ghara iwere ihe ọ bula n'ije-ha, ma-ọbughi nání nkpa-n'aka; ka ha ghara iwere ob͕e achicha, ma-ọbu àkpà, ma-ọbu ego n'ihe-ọkiké-ha; 9 ma ka ha je nēyi akpukpọ-ukwu sandal: Ọ si ha, Unu eyi-kwa-la uwe-ime abua. 10 O we si ha, Ebe ọ bula unu gābà n'ulo, nọgide n'ulo ahu rue mb͕e unu putara n'ebe ahu. 11 Ma ebe ọ bula nke nānaraghi unu nke-ọma, ebe ha anughi kwa okwu-unu, mb͕e unu nāpu n'ebe ahu, tichapu ájá di n'okpuru ukwu-unu ka ọ buru ha àmà. 12 Ha we pua, kwusa ka madu chègharia. 13 Ha nāchupu kwa ọtutu mọ ọjọ, were kwa manu olive te ọtutu ndi-nriaria, we me ka aru di ha ike. 14 Herod, bú eze, we nu, n'ihi na aha-Ya putara ìhè: o we si, Jọn onye nēme baptism, emewo ka o si na ndi nwuru anwu bilie, n'ihi nke à ka ike ndia nālusi ọlu ike na Ya. 15 Ma ndi ọzọ si, Ọ bu Elaija. Ndi ọzọ si kwa, Ọ bu onye-amuma, dika otù nime ndi-amuma. 16 Ma mb͕e Herod nuru ya, ọ si, Jọn, onye mu onwem bipuru isi-ya, emere onye ahu ka o si n'ọnwu bilie. 17 N'ihi na Herod onwe-ya zipururi jide Jọn, we ke ya ab͕u n'ulo-nkpọrọ n'ihi Herodias, nwunye Filip nwa-nna-ya: n'ihi na ọ luru ya na nwunye. 18 N'ihi na Jọn nāsi Herod, O zighi gi ezi n'iwu inwe nwunye nwa-nna-gi. 19 Ma Herodias dobere ya iwe n'obi, ọ chọ-kwa-ra ib͕u ya; ma ọ pughi; 20 n'ihi na Herod nātu egwu Jọn, ebe ọ matara na ọ bu nwoke nke bu onye ezi omume na onye di nsọ, ọ nēdebe kwa ya nke-ọma. Ọzọ, mb͕e ọ nuru okwu-ya, ọ nēchè uche nke-uku; o were kwa obi-utọ nānu ya. 21 Ma mb͕e ubọchi di oghere ruru, mb͕e Herod siri nri-anyasi na ncheta-ọmumu-ya nye ndi-amadi-ya, na ndi-ọchi-agha, na ndi-isi nke Galili; 22 mb͕e nwa-nwanyi Herodias onwe-ya bata-kwa-ra, te egwú, o we tọ ha utọ, bú Herod na ndi ya na ha nānọdu na nri; eze we si nwa-ab͕ọghọ ntà ahu, Riọm ihe ọ bula i nāchọ, na m'gēnye gi ya. 23 O we ṅuara ya iyi, si, Ihe ọ bula i gāriọm, m'gēnye gi ya, rue nkera nke ala-ezem. 24 O we pua, si nne-ya, Gini ka m'gāriọrọ onwem? O we si, Isi Jọn onye nēme baptism. 25 O were ọsọ bata ngwa ngwa n'ebe eze ahu nọ, we riọ, si, Anamachọ ka i nyem isi Jọn Baptist n'ọkwa ub͕u a. 26 O we wuta eze ahu n'obi nke-uku; ma n'ihi iṅu-iyi-ya nile, na n'ihi ndi nọduru na nri, ọ chọghi iju ya. 27 Ngwa ngwa eze we zipu onye-agha nēche nche, nye ya iwu ibaute isi-ya: o we je we bipu isi-ya n'ulo-nkpọrọ, 28 we bute isi-ya n'ọkwa, nye ya nwa-ab͕ọghọ ntà ahu; nwa-ab͕ọghọ ntà ahu we nye ya nne-ya. 29 Mb͕e ndi nēso uzọ-ya nuru ya, ha we bia būru ozu-ya, tọb͕ọ ya n'ílì. 30 Ndi-ozi Jisus we zukọ n'ebe Jisus nọ; ha we kọrọ Ya ihe nile, ka ihe ha mere ra, ka ihe ha ziri ra kwa. 31 O we si ha, Unu onwe-unu bia ichè n'ebe bu ọhia, ka unu zuru ike nke-ntà. N'ihi na ọtutu madu nābia nāla kwa, oghere adighi kwa ha ọbuná iri ihe. 32 Ha we je n'ub͕ọ-ha iche rue ebe bu ọhia. 33 Ma ọtutu madu huru ha mb͕e ha nēje, ha mata-kwa-ra ha, we si n'obodo ahu nile b͕akọta n'ebe ahu n'ukwu ala, buru ha uzọ. 34 O we puta, hu oké ìgwé madu, O we nwe ọmiko n'aru ha, n'ihi na ha di ka aturu nēnweghi onye nāzù ha: O we malite izí ha ọtutu ihe. 35 Mb͕e chi nēji nb͕u a, ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya, si, Ebe a bu ọhia, chi nēji kwa ub͕u a: 36 zilaga ha, ka ha we je n'ubi na obodo ntà nile buruburu, zuru onwe-ha ihe ha gēri. 37 Ma Ọ zara, si ha, Unu onwe-unu nye ha ihe ka ha rie. Ha we si Ya, Àyi gēe izuta ob͕e achicha nke ọgu shilling iri, nye ha ka ha rie? 38 Ọ si ha, Òb͕e achicha ole ka unu nwere? jenu, le. Mb͕e ha mara, ha si, Ise, na azù abua. 39 O we gwa ha ka madu nile nọdu ala n'òtù di iche iche n'elu ahihia ndu. 40 Ha we nọdu ala n'ahiri di iche iche, ọgu ise ọgu ise, na ọgu abua na iri ọgu abua na iri. 41 O we nara ob͕e achicha ise na azù abua ahu, le anya n'elu-igwe, gọzie ha, nyawa ob͕e achicha ahu; O we nēnye ndi nēso uzọ-Ya ka ha debe ha n'iru ndi ahu; O we kère ha nile azù abua ahu. 42 Ha nile we rie, afọ ju-kwa-ra ha. 43 Ha we tutukọ iberibe nile, njuputa nkata iri na abua, na nke azù abua ahu. 44 Ma ndi riri ob͕e achicha ise ahu bu nnù ndikom iri na nnù abua na ọgu iri. 45 Ngwa ngwa o we rugide ndi nēso uzọ-Ya ka ha ba n'ub͕ọ-ha, buru Ya uzọ gabiga n'ofè ọzọ na Betsaida, mb͕e Ya onwe-ya nēzilaga ìgwè madu ahu. 46 Mb͕e O kelesiri ha, O jere n'ugwu ahu ikpe ekpere. 47 Mb͕e o ruru anyasi, ub͕ọ ahu we di n'etiti oké osimiri, nání Ya onwe-ya nọ kwa n'ala. 48 Mb͕e Ọ huru ha ka ha nādọb͕u onwe-ha n'ọnyinya-ub͕o-ha, n'ihi na ifufe nēfegide ha, O we biakute ha dika nche nke-anọ n'abali, nēje ije n'elu oké osimiri; O we chọ igabiga ha: 49 ma mb͕e ha huru Ya ka Ọ nēje ije n'elu oké osimiri, ọ di ha ka Ọ bu mọ, ha we tisie nkpu ike: 50 n'ihi na ha nile huru Ya, obi we lọ ha miri. Ma Ọ kpayere ha uka ngwa ngwa, si ha, Nwenu obi-ike: ọ bu Mu; unu atula egwu. 51 O we rigokuru ha n'ub͕ọ; ifufe we febìe: ibobo we nwubiga ha ókè n'aru ri nne n'onwe-ha; 52 n'ihi na ha aghọtaghi ọlu ebube nke ob͕e achicha ise, kama emereri ka obi-ha me etili. 53 Mb͕e ha gabigasiri, ha bia rue ala rue Genesaret, tinye ub͕ọ-ha n'ala. 54 Mb͕e ha putara n'ub͕ọ, ngwa ngwa ọra we mazu Ya, 55 we b͕aghari n'ala ahu dum, malite ibughari ndi aru nādighi nma n'ute-ha, n'ebe ha nuru na Ọ nọ. 56 Ebe ọ bula Ọ batara, n'obodo ntà, ma-ọbu n'obodo, ma-ọbu n'ubi, ha we nātọb͕ọ ndi aru-ha nādighi ike n'ọma-ahia, ha nāriọ kwa Ya ka ha metu ọbuná ọnu-ọnu uwe-Ya aka: ewe zọputa ha, ka ha ra, bú ndi meturu Ya aka.

Mak 7

1 Ha we zukọ n'ebe Ọ nọ, bú ndi-Farisi, na ufọdu nime ndi-ode-akwukwọ, ndi siri na Jerusalem bia, 2 ndi hu-kwa-ra na ufọdu nime ndi nēso uzo-Ya nēri nri-ha n'aka ruru árú, nke ahu bu, aka anākwọghi akwọ. 3 N'ihi na ndi-Farisi, na ndi-Ju nile, ọ buru na ha akwọchaghi aka-ha, ha adighi-eri ihe, n'ihi na ha nējide ozizí nke ndi-okenye nyere ha n'aka idebe: 4 ọzọ, mb͕e ha si n'ahia lata, ọ buru na ha efesaghi onwe-ha miri, ha adighi-eri ihe: ọtutu ihe ọzọ di kwa, nke ha natara ijide, dika ime iko, na ite, na ihe ọla, baptism. 5 Ndi-Farisi na ndi-ode-akwukwọ we jua Ya, si, N'ìhi gini ka ndi nēso uzọ-Gi nējeghi ije dika ozizí ndi-okenye nyere ayi n'aka idebe, ma ha nēri nri-ha n'aka ruru árú? 6 Ma Ọ siri ha, Aisaia buru amuma nke-ọma n'isi unu ndi-iru-abua, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ndi nka nāsọpurum n'eb͕ub͕ere-ọnu-ha, Ma obi-ha di anya n'ebe M'nọ. 7 Ma ha nēbirim isi ala n'efu, Nēzí ihe madu nyere n'iwu ka ha buru ozizí-ha. 8 Unu nārapu ihe Chineke nyere n'iwu, jide kwa ozizí madu nyere n'aka-unu idebe. 9 O we si ha, Unu nāju ihe Chineke nyere n'iwu nke-ọma, ka unu we debe ozizí nke enyere n'aka-unu idebe. 10 N'ihi na Moses siri, Sọpuru nna-gi na nne-gi; na, Onye kwujọrọ nna ma-ọbu nne, ya nwua ọnwu ahu: 11 ma unu onwe-unu nāsi, Ọ buru na madu si nna-ya ma-ọbu nne-ya, Ihe ọ bula i gēritari n'akam bu Kọban, isi-ya bu, Ihe enyere Chineke; 12 unu ekweghi ya ọzo ka o mere nna-ya ma-ọbu nne-ya ihe ọ bula: 13 nēme okwu Chineke ka ọ buru ihe-efu site n'ozizí enyere unu n'aka idebe, nke unu nyere madu n'aka idebe: ọtutu ihe di otú a ka unu nēme kwa. 14 O we kpọ ìgwè madu ahu ọzọ biakute Ya, Ọ si ha, Nurunu okwum, unu nile, ghọta-kwa-nu: 15 ọ dighi ihe ọ bula di madu n'ìhè nke puru imeru ya, ma ọ buru na ọ ba nime ya: kama ihe si nime madu puta bu ihe nēmeru madu. 16 Ọ buru na onye ọ bula nwere nti inu ihe, ya nu. 17 Mb͕e Ọ ghara ìgwè madu ahu ba n'ulo, ndi nēso uzọ-Ya we jua Ya isi ilu ahu. 18 O we si ha, Ùnu onwe-unu di kwa otú a ka ndi nēnweghi nghọta? Ùnu atugharighi uche-unu, na ihe ọ bula nke si n'ìhè ba nime madu, na ọ pughi imeru ya, 19 n'ihi na ọ bàghi n'obi-ya, kama n'afọ-ya, o we pua n'ulo-ǹsí? O kwuru nka, ka O me ka ihe-oriri nile di ọcha. 20 O we si, Ihe nke si nime madu puta, nke ahu nēmeru madu. 21 N'ihi na n'ime, bú n'obi madu, ka èchìchè nile jọrọ njọ si aputa, ikwa-iko nile, ori nile, ib͕u-madu nile, 22 ikwa-iko nile nke ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di, anya-uku nile, ajọ ihe nile, aghughọ, agu ikwa-iko, ajọ anya, nkwulu, npakọ, enweghi-uche: 23 ajọ ihe ndia nile nēsi nime madu aputa, ha nēmeru madu. 24 O we si n'ebe ahu bilie, je n'ókè-ala Taia na Saidon. O we ba n'ulo, Ọ chọghi kwa ka onye ọ bula mara: ma apughi izota Ya. 25 Ma ngwa ngwa otù nwanyi, nke nwa-ya nwanyi nke-ntà nwere mọ nādighi ọcha, ebe ọ nuru ùdé-Ya, ọ bia da n'ala n'ukwu-Ya. 26 Ma nwanyi ahu bu onye-Grik, buru onye Sairo-Finisia n'ọmumu-ya. O we kpere Ya ka Ọ chupu mọ ọjọ ahu n'aru nwa-ya nwanyi. 27 O we si ya, Kwe ka afọ buru uzọ ju umu: n'ihi na ọ dighi nma inara nri umu tupuru umu-nkita. 28 Ma ọ zara, si Ya, E, Onye-nwe-ayi: ọbuná umu-nkita n'okpuru table nēri irighiri ufọdu na nri umu ntà. 29 O we si ya, N'ihi okwu a laba; mo ọjọ ahu apuwo n'aru nwa-gi nwanyi. 30 O we la n'ulo-ya, hu nwatakiri-ya na atọb͕ọrọ ya n'elu ihe-ndina-ya, hu kwa na mọ ọjo ahu apuwori. 31 O si-kwa-ra n'ókè-ala Taia pua ọzọ, we gabiga n'etiti Saidon, si n'etiti ókè-ala Dekapọlis, rue oké osimiri Galili. 32 Ha we kutara Ya otù onye nti chiri, nke nāsu kwa nsu; ha we riọ Ya ka O bikwasi ya aka-Ya. 33 O we si n'igwè madu ahu kupu ya iche, we tiye nkpisi-aka-Ya na nti-ya abua, bu kwa ọnu-miri, metu ire-ya; 34 O we le anya n'elu-igwe, sua udè, si ya, Efata, nke isi-ya bu, Ghere oghe. 35 Nti-ya abua we ghere oghe, ekike ire-ya tọpu kwa, o we kwuzi okwu. 36 O we gwasie ha ike ka ha ghara igwa onye ọ bula: ma ka ọ ra, bú otú Ya onwe-ya gwasiri ha ike, otú a ka ha nēkwusa kari ya nke-uku. 37 Ibobo nwubiga-kwa-ra ha ókè n'aru, ha si, O mewo ihe nile nke-ọma: Ọ nēme ọbuná ndi nti chiri ka ha nu ihe, me kwa ndi nāpughi ikwu okwu ka ha kwue.

Mak 8

1 Na mb͕e ahu, mb͕e oké ìgwè madu di kwa ọzọ, mb͕e ha nēnweghi kwa ihe ha gēri, Ọ kpọrọ ndi nēso uzọ-Ya ka ha biakute Ya, si ha, 2 Enwerem ọmiko n'aru ìgwè madu a, n'ihi na Mu na ha nọgidere ubọchi atọ ub͕u a, ha enweghi kwa ihe ha gēri: 3 ọ buru kwa na ezilagam ha n'ulo-ha n'ọnu efu, ha gāda #mbà n'uzọ; ufọdu nime ha si kwa n'ebe di anya bia. 4 Ndi nēso uzọ-Ya we za Ya, si, Ọle ebe ka madu gēsi pu inwe ob͕e achicha inyeju ndia afọ nime ọhia ebe a? 5 O we jua ha, si, Ùnu nwere ob͕e achicha ole? Ha we si, Asa. 6 O we gwa ìgwè madu ahu ka ha nọdu ala: O we nara ob͕e achicha asa ahu; mb͕e O kelesiri ekele, Ọ nyawa ha, we nēnye ndi nēso uzọ-Ya, ka ha debe n'iru ha; ha we debe ha n'iru ìgwè madu ahu. 7 Ha nwe-kwa-ra azù ntà ole-na-ole: O we gọzie ha, si ka edebe kwa ndia n'iru ha. 8 Ha we rie, afọ ju kwa ha: ha we tutukọ iberibe fọduru, abọ asa. 9 Ma ndi ahu ra ka nnù iri: O we zilaga ha. 10 Ngwa ngwa Ya na ndi nēso uzọ-Ya we ba n'ub͕ọ-ha, bia n'akuku Dalmanuta. 11 Ndi-Farisi we puta, malite iju Ya ajuju, nāchọ ihe-iriba-ama n'aka-Ya site n'elu-igwe, n'inwa Ya. 12 O we sua udè nke-uku na mọ-Ya, si, Gini mere ọb͕ọ a nāchọ ihe-iriba-ama? n'ezie asim unu, Agaghi-enye ọb͕ọ a ihe-iriba-ama. 13 O we rapu ha, ba kwa n'ub͕ọ ọzọ, we gabiga n'ofè ọzọ. 14 Ha we chezọ iwere ob͕e achicha; ha enweghi kwa n'aka-ha nime ub͕ọ ihe kariri otù ob͕e achicha. 15 O we gwasie ha ike, si, Nēlenu anya, lezienu anya ihe ndi-Farisi, bú ihe nēko achicha, na ihe Herod, bú ihe nēko achicha. 16 Ha we nēkwurita n'etiti onwe-ha, si, Ọ bu n'ihi na ayi enweghi ob͕e achicha. 17 Ebe Jisus mara ya Ọ si ha, Gini mere unu nēkwurita n'onwe-unu, n'ihi na unu enweghi ob͕e achicha? ùnu akātugharighi uche, ùnu akāghọtaghi kwa? èmere obi-unu etili? 18 Unu ahughi uzọ mb͕e unu nwere anya? ùnu anughi kwa ihe mb͕e unu nwere nti? ùnu echetaghi kwa? 19 Mb͕e M'nyawara ob͕e achicha ise nye nnù madu iri na nnù abua na ọgu iri, ǹkata ole juputara n'iberibe ka unu bulitere? Ha si Ya, Iri na abua. 20 Mb͕e M'nyawara asa nye nnù madu iri, ìberibe juputara abọ ole ka unu tutukọrọ? Ha we si Ya, Asa. 21 O we si ha, Ùnu akāghọtaghi? 22 Ha we bía na Betsaida. Ha we kutara Ya onye-ìsì, riọ Ya ka O metu ya aka. 23 O we jide onye-ìsì ahu n'aka, duputa ya n'obodo ntà ahu; mb͕e Ọ busara ya ọnu-miri n'anya, bikwasi kwa ya aka-Ya abua, O we jua ya, si, Ọ̀ di ihe i huru? 24 O we le anya n'elu, si, Ahurum madu; n'ihi na ahurum ha dika osisi, ha nējeghari. 25 Mb͕e ahu O bikwasiri aka-Ya abua n'anya-ya ọzọ; o we legide anya, eme kwa ka anya-ya di ka ha di na mbu, o we hucha ihe nile. 26 O we zilaga ya n'ulo-ya, si, Abàla ọbuná n'obodo ntà nke à. 27 Jisus we pua, Ya na ndi nēso uzọ-Ya, ba n'obodo ntà nile nke Sisaria Filipi: mb͕e ha nọ n'uzọ O we jua ndi nēso uzọ-Ya, si ha, Onye ka madu nāsi na Mu onwem bu? 28 Ha we gwa Ya, si, Jọn Baptist: ndi ọzọ si kwa, Elaija; ma ndi ọzọ si, Otù nime ndi-amuma. 29 Ya onwe-ya we jua ha, si, Ma ọ̀ bu onye ka unu onwe-unu si na Mu bu? Pita we za, si Ya, Gi onwe-gi bu Kraist ahu. 30 O we dọ ha aka na nti ka ha ghara igwa onye ọ bula okwu bayere Ya. 31 O we malite izí ha, na Nwa nke madu aghaghi ihu ọtutu ahuhu, na ndi-okenye na ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ aghaghi kwa iju Ya, na aghaghi ib͕u Ya, na Ọ ghaghi kwa isi n'ọnwu bilie mb͕e ubọchi atọ gasiri. 32 Ọ nēkwuwa kwa, okwu ahu. Pita we kuru Ya nye n'aru, malite ibara Ya nba. 33 Ma mb͕e O chighariri, hu ndi neso uzọ-Ya, Ọ bara Pita nba si, Ga n'azum, Setan: n'ihi na i dighi-atukwasi uche-gi n'ihe Chineke, kama ọ bu n'ihe madu. 34 O we kpọ ìgwè madu ahu, ha na ndi nēso uzọ-Ya, ka ha biakute Ya, Ọ si ha, Ọ buru na onye ọ bula achọ ka o som n'azu, ya ju onwe-ya, buli kwa obe-ya, nēsokwam. 35 N'ihi na onye ọ bula nke nāchọ izọputa ndu-ya, ọ gētufu ya; ma onye ọ bula nke gētufu ndu-ya n'ihim na n'ihi ozi ọma nkem, ọ gāzọputa ya. 36 N'ihi na ùrù gini ka ọ bara madu, irita elu-uwa dum n'urù, ewe napu ya ndu-ya? 37 N'ihi na ìhe-nb͕anwe gini ka madu gēji b͕anwe ndu-ya? 38 N'ihi na onye ọ bula ihere Mu onwem na okwum nile gēme n'ọb͕ọ a nke nākwa iko, nke nēmehie kwa, ihere onye ahu gēme kwa Nwa nke madu, mb͕e Ọ gābia n'ebube nke Nna-Ya, Ya na ndi mọ-ozi-Ya di nsọ.

Mak 9

1 O we si ha, N'ezie asim unu, Na n'etiti ndi guzoro nso ufọdu di n'ebe a, ndi nāgaghi-edetu ọnwu ire ma-ọli, rue mb͕e ha gāhu ala-eze Chineke ka ọ biaworo n'ike. 2 Mb͕e ubọchi isi gasiri Jisus chiri Pita na Jemes na Jọn tiyere Onwe-ya, O kuru ha rigo n'ugwu di elu we pua iche, nání ha: O we nwogha n'iru ha: 3 uwe-Ya nile we nēnwupu, nācha oké ucha; dika onye ọ bula nke nēme ka ákwà di ocha n'uwa nāpughi ime ka ha di ọcha. 4 Ewe me ka ha hu Elaija na Moses: ha na Jisus nēkwurita kwa okwu. 5 Pita we za, si Jisus, Rabai, ọ di nma ka ayi nọ n'ebe a: ka ayi ma kwa ulo-ikwū atọ; ka otù diri Gi, ka otù di-kwa-ra Moses, ka otù di-kwa-ra Elaija. 6 N'ihi na ọ maghi ihe ọ gāza; n'ihi na ha nātu oké egwu. 7 Igwe-oji we bia kpuchie ha: olu we si n'igwe-oji ahu puta, si, Onye a bu Ọkparam M'huru n'anya: nurunu okwu-Ya. 8 Na mberede, mb͕e ha lere anya buruburu, ha ahughi onye ọ bula ọzọ, ma-ọbughi nání Jisus, Ya na ha. 9 Mb͕e ha si n'ugwu ahu nārida, O we gwasie ha ike ka ha ghara ikọrọ onye ọ bula ihe ha hururi, ma-ọbughi mb͕e Nwa nke madu gēsiwori na ndi nwuru anwu bilie. 10 Ha we jide okwu ahu, nājurita onwe-ha ihe isi-na-ndi-nwuru-nawu-bilie bu. 11 Ha we jua Ya, si, Ndi-ode-akwukwọ si aṅa kwu na Elaija aghaghi ibu uzọ bia? 12 O we si ha, Ọ bu ezie na Elaija bu uzọ bia, nēme kwa ka ihe nile di ka ha di na mbu: èsiwo kwa aṅa ede okwu a bayere Nwa nke madu n'akwukwọ nsọ, na Ọ gāhu ọtutu ahuhu, eme kwa Ya ihe-efu? 13 Ma asim unu, na Elaija abiawo, ha me-kwa-ra ya ka ihe ha chọrọ ra, dika edeworo okwu bayere ya n'akwukwọ nsọ. 14 Mb͕e ha biakutere ndi nēso uzọ-Ya, ha we hu oké ìgwè madu ka ha nọ ha buruburu, ha hu kwa ndi-ode-akwukwọ ka ha nāju ha ajuju. 15 Ngwa ngwa ibobo we nwua ìgwè madu ahu nile si-ike n'aru, mb͕e ha huru Ya, ha we b͕akuru Ya, kele Ya. 16 O we jua ha, si, Àjuju gini ka unu nāju ha? 17 Otù nwoke we si n'ìgwè madu ahu za Ya, si, Onye-ozizi, ekutaram I nwam nwoke, nke nwere mọ nādighi-ekwu okwu; 18 ebe ọ bula o jidere ya, o we tie ya n'ala: ọ nāsu kwa ufufu n'ọnu, nāta kwa ikekere-ezé, nāta kwa aru: m'we gwa ndi nēso uzọ-Gi ka ha chupu ya; ma ba enweghi ike. 19 O we za ha, si, Unu ọb͕ọ nēnweghi okwukwe, rùe ole mb͕e ka Mu na unu gānọ? rùe ole mb͕e ka M'gānagide unu? unu kutaram ya. 20 Ha we kuru ya biakute Ya: mb͕e ọ huru Ya, ngwa ngwa mọ ahu we sesie ya ike; o we da n'ala, nāturu, nāsu kwa ufufu. 21 O we jua nna-ya, si, Ò ruru ole mb͕e ihe a meworo ya? O we si, Site na nwata. 22 Ọtutu mb͕e ọ tubà-kwa-ra ya n'ọku na nime miri, ila ya n'iyì: ma ọ buru na I puru ime ihe, nwe ọmiko n'aru ayi, nyere ayi aka. 23 Ma Jisus siri ya, Ọ buru na I puru! Onye nke kwere puru ime ihe nile. 24 Ngwa ngwa nna nwatakiri ahu tiri nkpu, si, Ekwem; nyere ekweghi-ekwem aka. 25 Ma mb͕e Jisus huru na ìgwè madu nāb͕akọta, Ọ bara mọ ahu nādighi ọcha nba, si ya, Gi mọ nādighi-ekwu okwu na nke nti chiri, Mu onwem nēnye gi iwu, si nime ya puta, abà-kwa-la nime ya ọzọ. 26 Mb͕e o tisiri nkpu, sesi kwa ya ike, o we puta: nwa ahu we di ka ozu; ya mere ndi ka nime ha si, Ọ nwuruwo. 27 Ma Jisus jidere ya n'aka, palie ya elu; o we bilie. 28 Mb͕e Ọ batara n'ulo-ha, ndi nēso uzọ-Ya we jua Ya iche, si, Gini mere ayi onwe-ayi apughi ichupu mọ ahu? 29 O we si ha, Aha mọ nka apughi iputa site n'ihe ọ bula, ma-ọbughi site n'ekpere. 30 Ha we si n'ebe ahu pua, gabiga n'etiti Galili; Ọ chọghi kwa ka onye ọ bula mara. 31 N'ihi na Ọ nēzí ndi nēso uzọ-Ya ihe, si ha, Anārara Nwa nke madu nye n'aka madu, ha gēb͕u kwa Ya; mb͕e eb͕usiri Ya, Ọ gēsi n'ọnwu bilie mb͕e ubọchi atọ gasiri. 32 Ma ha aghọtaghi okwu ahu, ha nātu kwa egwu iju Ya. 33 Ha we bia rue Kapanaum: mb͕e Ọ nọ, n'ulo-ha O we jua ha, si, Gini ka unu nēkwurita n'uzọ? 34 Ma ha kpuchiri ọnu-ha: n'ihi na ha nārurita uka n'uzọ onye ka ibe-ya n'etiti ha. 35 Ọ we nọdu ala, kpọ ndi-ozi iri na abua ahu; O we si ha, Ọ buru na onye ọ bula nācho ka ọ buru onye-isi, ọ gābu onye-ikpe-azu n'etiti unu nile, na onye nējere unu nile ozi. 36 O we kuru nwatakiri debe ya n'etiti ha: mb͕e O kusiri ya n'aka-Ya, Ọ si ha, 37 Onye ọ bula nke gānara otù nime umu-ntakiri di otú a n'aham nke-ọma, ọ bu Mu onwem ka Ọ nānara nke-ọma: onye ọ bula nke nānara kwa Mu nke-ọma, ọ bughi Mu ka ọ nānara nke-ọma, kama ọ bu Onye ziterem. 38 Jọn siri Ya, Onye-ozizí, ayi huru otù onye ka ọ nāchupu ndi-mọ ọjọ n'aha-Gi: ayi we b͕ochie ya, n'ihi na ọ dighi-eso ayi. 39 Ma Jisus siri, Unu eb͕ochila ya: n'ihi na ọ dighi onye ọ bula nke gālu ọlu di ike n'aham, nke gāpu kwa ikwujọm ọsọsọ. 40 N'ihi na onye nādighi-emegide ayi diri ayi. 41 N'ihi na onye ọ bula nke gēkuru otù iko miri nye unu ṅua, n'ihi na unu bu ndi nke Kraist, n'ezie asim unu, na ọ gaghi-etufu ugwọ-ọlu-ya ma-ọli. 42 Ọzọ, onye ọ bula nke gēme otù nime ndi ntà ndia ndi kwerenu ka ọ ma n'ọnyà, ọ gāka ya nma ma ewere nkume-igwe-nri nke inyinya-ibu nādọkpughari kwuba ya n'olu, tubà ya n'oké osimiri. 43 Ọzọ ọ buru na aka-gi eme gi ka i ma n'onyà, bipu ya: o di gi nma ibà na ndu n'ọlusi, kari inwe aka-gi abua ba n'ọku ala-mọ, n'ọku anyughi-anyu; 44 ebe ikpuru-ha nādighi-anwu, ọku-ha adighi-anyu kwa anyu. 45 Ọ buru kwa na ukwu-gi eme gi ka i ma n'ọnyà, bipu ya: ọ di gi nma ibà na ndu na ngwurọ, kari inwe ukwu-gi abua atubà gi n'ọku ala-mọ; 46 ebe ikpuru-ha nādighi-anwu, ọku-ha adighi-anyu kwa anyu. 47 Ọ buru kwa na anya-gi eme gi ka i ma n'ọnyà, tupu ya: ọ di gi nma ibà n'ala-eze Chineke nēnwe otù anya, kari inwe anya abua atubà gi n'ọku ala-mọ; 48 ebe ikpuru nke nēri ha nādighi-anwu, ọku anyughi kwa anyu. 49 N'ihi na agēji ọku b͕a onye ọ bula nnú. 50 Nnú di nma: ma ọ buru na nnú etufuwo utọ-ya, gini ka unu gēji me ya ka ọ di utọ? Nwenu nnú nime unu, unu na ibe-unu di kwa n'udo.

Mak 10

1 O we si n'ebe ahu bilie, bia n'ókè-ala Judia, ya na ofè ọzọ nke Jọdan: ìgwè madu nile we zukọ ọzọ n'ebe Ọ nọ; ka O siri eme, O we nēzí ha ihe ọzọ. 2 Ndi-Farisi we biakute Ya, jua Ya, si, Ò ziri ezi n'iwu ka nwoke rapu nwunye-ya? nānwa Ya. 3 O we za, si ha, Gini ka Moses nyere unu n'iwu? 4 Ha we si, Moses kwere ka ede akwukwọ nkewa, ka arapu kwa ya. 5 Ma Jisus siri ha, N'ihi obi-etili-unu ka o dere unu iwu a n'akwukwọ. 6 Ma site na nmalite òkìkè uwa, Nwoke na nwanyi ka O mere ha. 7 N'ihi nka ka nwoke gēji rapu nna-ya na nne-ya, rapara n'aru nwunye-ya; 8 ha abua ewe ghọ otù anu-aru: ya mere ha abughi kwa madu abua ọzọ, kama ọ bu otù anu-aru. 9 Ya mere, ihe Chineke kekọtara, madu atọsala. 10 N'ulo ndi nēso uzọ-Ya we jua Ya ajuju okwu a ọzọ. 11 O we si ha, Onye ọ bula nke gārapu nwunye-ya, luru kwa nwunye ọzọ, ọ nākwa iko megide ya: 12 ọ buru kwa na nwanyi onwe-ya arapu di-ya, luru kwa di ọzọ, ọ nākwa iko. 13 Ha we kutara Ya umu-ntakiri, ka O we metu ha aka: ma ndi nēso uzọ-Ya bara ha nba. 14 Ma mb͕e Jisus huru ya, iwe were Ya nke-uku, Ọ si ha, Kwenu ka umu-ntakiri biakutem; unu eb͕ochila ha: n'ihi na ala-eze Chineke bu nke ndi di otú a. 15 N'ezie asim unu, Onye ọ bula nke nāgaghi-anara ala-eze Chineke dika nwatakiri, ọ gaghi-abà nime ya ma-ọli. 16 O we kuru ha n'aka-Ya, bikwasi ha aka-Ya abua, we gọzie ha nke-ọma. 17 Mb͕e ọ nāpu n'uzọ, otù onye we b͕akuru Ya, b͕uru Ya ikperè, jua Ya, si, Ezi Onye-ozizí, gini ka m'gēme ka m'we keta ndu ebighi-ebi? 18 Ma Jisus siri ya, Gini mere i nākpọm ezi onye? ọ dighi onye ọ bula bu ezi onye ma-ọbughi otù Onye, bú Chineke. 19 I matawo ihe nile enyere n'iwu, Eb͕ula madu, Akwala iko, Ezula ori, Ab͕ala àmà ugha, Emeb͕ula madu, Sọpuru nna-gi na nne-gi. 20 Ma ọ siri Ya, Onye-ozizí, ihe ndia nile ka m'ribara ama site n'okorọbia. 21 Ma mb͕e Jisus lere ya anya Ọ hu ya n'anya, si ya, Otù ihe fọduru gi ime: laba, re ka ihe i nwere ra, nye ndi-ob͕eye, i gēnwe kwa àkù n'elu-igwe: bia kwa, som. 22 Ma iru-ya b͕aruru n'okwu a, o we la na nwuta: n'ihi na ọ bu onye nwere ihe ri nne. 23 Jisus we le anya buruburu, si ndi nēso uzọ-Ya, Le otú ọ diri ndi nwere àkù ike ibà n'ala-eze Chineke! 24 Ma ibobo okwu-Ya nile nwuru ndi nēso uzọ-Ya n'aru. Ma Jisus za-kwa-ra ọzọ, si ha, Umum, le otú ọ diri ha ike ibà n'ala-eze Chineke, bú ndi wereworo obi-ha tukwasi n'àkù! 25 Ọ dikariri camel nfé igabiga n'anya àgìgá, kari ọgaranya ibà n'ala-eze Chineke. 26 Ma ibobo nwubigara ha ókè n'aru, ha sirita onwe-ha, Onye kwa ka apuru izọputa? 27 Jisus lere ha anya, si, N'ebe madu nọ ọ bu ihe anāpughi íme, ma ọ bughi n'ebe Chineke nọ n'ihi na apuru ime ihe nile n'ebe Chineke nọ. 28 Pita malitere isi Ya, Le, ayi onwe-ayi rapuru ihe nile, ayi esowo kwa Gi. 29 Jisus siri, N'ezie asim unu, Ọ dighi onye ọ bula nke rapuru ulo, ma-ọbu umu-nne-ndikom, ma-ọbu umu-nne-ndinyom, ma-ọbu nne, ma-ọbu nna, ma-ọbu umu, ma-ọbu ubi, n'ihim, na n'ihi ozi ọma nkem, 30 ma-ọbughi na ọ gānata ọgu ise ọgu ise ub͕u a n'oge a, ulo, na umu-nne-ndikom, na umu-nne-ndinyom, na nne, na umu, na ubi, ha na nsob͕u; ọ gānata kwa ndu ebighi-ebi n'oge nke nābia. 31 Ma ọtutu ndi bu uzọ gābu ndi-ikpe-azu; ndi-ikpe-azu gābu kwa ndi bu uzọ. 32 Ma ha nọ n'uzọ, nārigoro Jerusalem; Jisus we nāga n'iru ha: ibobo nwu-kwa-ra ha n'aru; ma ndi nēso Ya nātu egwu. O we kuru ndi-ozi iri na abua ahu tiyere Onwe-ya ọzọ, malite igwa ha ihe nile gaje ime Ya, 33 si, Le, ayi nārigoro Jerusalem; agārara kwa Nwa nke madu nye n'aka ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ; ha gāma kwa Ya ikpe ọnwu, rara Ya nye n'aka ndi mba ọzọ: 34 ha gēme kwa Ya ihe-ọchi, busa Ya ọnu-miri, pia Ya ihe, b͕ue Ya: Ọ gēsi kwa n'ọnwu bilie mb͕e ubọchi atọ gasiri. 35 Jemes na Jọn, bú umu Zebedi, we biakute Ya, si Ya, Onye-ozizí, ayi nāchọ ka I mere ayi ihe ọ bula ayi gāriọ Gi. 36 O we si ha, Gini ka unu nāchọ ka M'mere unu? 37 Ha we si Ya, Me ayi ka ayi nọdu, otù n'aka-nri-Gi, otù n'aka-ekpe, n'ebube-Gi. 38 Ma Jisus siri ha, Unu amataghi ihe unu nāriọ. Ùnu puru iṅu iko ahu nke Mu onwem nāṅu? ma-ọbu ka eme unu baptism ahu dika anēme Mu onwem? 39 Ha we si Ya, Ayi puru. Jisus we si ha, Iko Mu onwem nāṅu ka unu gaṅu; baptism nke anēme Mu onwem ka agēme kwa unu: 40 ma inọdu n'aka-nrim ma-ọbu n'aka-ekpem abughi nkem inye: kama ọ diri ndi edoziworo ya. 41 Mb͕e ndi-ozi iri fọduru nuru ya iwe we malite iwe ha nke-uku n'ihi Jemes na Jọn. 42 Jisus we kpọ ha biakute Ya, si ha, Unu amatawo na ndi aguru ibu ndi-isi nke mba nile ọzọ nēme ha dika ndi nwe ha; ndi uku ha nāchi kwa ha. 43 Ma ọ dighi otú a n'etiti unu: kama onye ọ bula nke nāchọ ka eme ya onye uku n'etiti unu, ọ gābu onye nējere unu ozi: 44 ọzọ, onye ọ bula nke nāchọ ka ọ buru onye-isi n'etiti unu, ọ gabu orù unu nile. 45 N'ihi na Nwa nke madu Onwe-ya abiaghi ka ejere Ya ozi, kama ka O je ozi, ka O were kwa ndu-Ya nye ka ọ buru ihe-nb͕aputa n'ọnọdu ọtutu madu. 46 Ha we bia rue Jeriko: mb͕e Ọ nāputa na Jeriko, Ya na ndi nēso uzọ-Ya na oké ìgwè madu, nwa-nwoke Timiọs, bú Bātimiọs, onye-aririọ kpuru ìsì, nānọdu n'akuku uzọ. 47 Mb͕e ọ nuru na ọ bu Jisus Onye Nazaret, o we malite íti nkpu, na isi, Nwa Devid, Jisus, merem ebere. 48 Ọtutu madu we bara ya nba, ka o kpuchie ọnu-ya: ma o tikariri nkpu nke-uku, si, Nwa Devid, merem ebere. 49 Jisus we guzo, si, Kpọnu ya. Ha we kpọ onye-ìsì ahu, si ya, Nwe obi ike: bilie, Ọ nākpọ gi. 50 O we chifu uwe-ya, zọlie, biakute Jisus. 51 Jisus we za ya, si, Gini ka i nāchọ ka M'mere gi? Onye-ìsì ahu we si ya, Rabonai, ka eme ka m'hu uzọ. 52 Jisus we si ya, Laba; okwukwe-gi azọputawo gi. Ngwa ngwa ewe me ka ọ hu uzọ, o we nēso Ya n'uzọ.

Mak 11

1 Mbe ha nābiaru Jerusalem nso, rue Betfagi na Betani nso, n'uzọ ugwu Olive, o we ziga madu abua n'etiti ndi nēso uzọ-Ya, 2 si ha, Jenu n'obodo ntà nke di na ncherita-iru unu: ngwa ngwa mb͕e unu nābà nime ya, unu gāhu nwa-inyinya-ibu elibeworo, nke madu ọ bula akānọkwasighi; tọpunu ya, sekputa ya. 3 Ọ buru kwa na onye ọ bula si unu, Gini mere unu nēme nka? sinu, Ọ di Onye-nwe-ayi nkpà; ngwa ngwa Ọ gēzighachi ya n'ebe a ọzọ. 4 Ha we je, hu nwa-inyinya-ibu elibere n'ọnu-uzọ n'èzí n'amá; ha we tọpu ya. 5 Ufọdu nime ndi guzoro n'ebe ahu we si ha, Ùnu nēme gini, nātọpu nwa-inyinya-ibu ahu? 6 Ha we gwa ha okwu dika Jisus kwuru: ha we rapu ha. 7 Ha we sekputara Jisus nwa-inyinya-ibu ahu, wukwasi ya uwe-ha; O we nọkwasi ya. 8 Ọtutu madu we tusa uwe-ha n'uzọ; ndi ọzọ akwukwọ osisi, nke ha b͕ubitara n'ubi. 9 Ndi naga n'iru, na ndi nēso, nēti nkpu, si, Hosanna; Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n'aha Onye-nwe-ayi: 10 Ihe agọziri agọzi ka ala-eze bu nke nābia, ala-eze nke nna-ayi Devid: Hosanna n'ebe kachasi ihe nile elu. 11 O we ba Jerusalem, n'ulo uku Chineke; mb͕e O lesiri ihe nile anya buruburu, ebe ọ bu mb͕e anyasi ub͕u a, O we pua je Betani, Ya na ndi-ozi iri na abua ahu. 12 N'echi-ya, mb͕e ha putara na Betani, agu guru Ya. 13 Mb͕e Ọ huru osisi fig n'ebe di anya nke nwere akwukwọ ndu, Ọ bia, ma ebe ọ di otú a Ọ gāhu ihe n'elu ya: ma mb͕e Ọ biaruru ya aru, Ọ hughi ihe ọ bula ma-ọbughi akwuwọ ndu: n'ihi na ọ bughi oge nkpuru fig. 14 O we za, si ya, Onye ọ bula eri-kwa-la nkpuru ọzọ si n'elu gi puta ebighi-ebi. Ndi nēso uzọ-Ya we nu ya. 15 Ha we bia rue Jerusalem: O we ba n'ulo uku Chineke, malite ichupu ndi nēre na ndi nāzu n'ulo uku Chineke, O we kpùe table nile nteke ndi nāb͕anwe ego iru, na oche nile nke ndi nēre nduru; 16 O kweghi kwa ka onye ọ bula būru ihe gabiga n'etiti ulo uku Chineke. 17 O we zí ihe, si ha, Èdeghi ya n'akwukwọ nsọ, si, Agākpọ ulom ulo ekpere mba nile? ma unu onwe-unu emewo ya ọb͕à ndi nāpunara madu ihe. 18 Ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ we nu ya, ha we nāchọ uzọ ha gēsi la Ya n'iyì: n'ihi na ha nātu egwu Ya, n'ihi na ibobo ozizí-Ya nwuru ìgwè madu nile n'aru. 19 Mb͕e ọ bula o ruru anyasi Ọ nēsi n'obodo apu. 20 Mb͕e ha nāga n'ututu, ha we hu osisi fig ahu na ọ kpọnwururi site na nkpọrọgwu. 21 Pita we cheta, si Ya, Rabai, le, osisi fig nke I buru ọnu akpọnwuwo. 22 Jisus we za, si ha, Nwenu okwukwe Chineke. 23 N'ezie asim unu, Onye ọ bula nke gāsi ugwu a, Ka ewelie gi, tubà gi nime oké osimiri; nke nāgaghi-enwe obi abua, kama o kwere na ihe ọ nēkwu nēme; ọ gādiri ya. 24 Ya mere M'ji si unu, Ihe nile, ka ha ra, bú nke unu nēkpe n'ekpere riọ kwa, kwenu na unu anatawo ha, ha gādiri unu. 25 Ọzọ, mb͕e ọ bula unu guzoro nēkpe ekpere, b͕agharanu, ma o buru na unu nwere ihe ọ bula megide onye ọ bula; ka Nna-unu Nke bi n'elu-igwe we b͕aghara kwa unu ndahie nile unu. 26 Ma ọ buru na unu onwe-unu ab͕agharaghi, Nna-unu Nke bi n'elu-igwe agaghi-ab͕aghara unu ndahie nile unu. 27 Ha we bia rue Jerusalem ọzọ: mb͕e Ọ nējeghari n'ulo uku Chineke, ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ na ndi-okenye we biakute Ya; 28 ha we si Ya, Ọ̀ bu n'aha ike gini ka I nēme ihe ndia? ma-ọbu ònye nyere Gi ike a ka I we me ihe ndia? 29 Ma Jisus siri ha, M'gāju unu otù okwu, unu zakwam, emesia M'gāgwa unu aha ike M'ji eme ihe ndia. 30 Baptism nke Jọn, ò sitere n'elu-igwe, ma-ọbu na ò sitere n'aka madu? zanum. 31 Ha we kwurita n'etiti onwe-ha, si, Ọ buru na ayi asi, O sitere n'elu-igwe; Ọ gasi, N'ìhi gini kwa ka unu nējighi kwe ya? 32 Ma àyi gāsi kwa, O sitere n'aka madu? ha nātu egwu ndi-Ju: n'ihi na madu nile guru Jọn na ọ bu onye-amuma n'ezie. 33 Ha we za Jisus, si, Ayi amataghi. Jisus we si ha, Mu onwem agaghi-agwa kwa unu aha ike M'ji eme ihe ndia.

Mak 12

1 O we malite igwa ha okwu n'ilu. Otù onye kuru ubi-vine, ọ b͕a ya ogige gburugburu, gwu kwa ebe inara manya agāzọchapu na nkpuru-vine, o wu-kwa-ra ulo-elu, were kwa ya tiye n'aka ndi-ọlu-ubi, we je ala ọzọ. 2 O we zigara ndi-ọlu-ubi ahu otù orù n'oge ighọ nkpuru, ka ọ nata n'aka ndi-ọlu-ubi nkpuru ufọdu n'ubi-vine-ya. 3 Ha we jide ya, pia ya ihe, zilaga ya n'aka efu. 4 Ọzọ kwa o we zigara ha orù ọzọ; ha we tiwa isi onye ahu, me ya ihe-ihere. 5 O we ziga onye ọzọ; ha we b͕ue onye ahu: na ọtutu ndi ọzọ; ha nāpia ufọdu ihe, nēb͕u kwa ufọdu. 6 O nwere otù onye fọduru, bú ọkpara ọ huru n'anya: o zigara ya ikpe-azu jekuru ha, si, Ha gāsọpuru ọkparam. 7 Ma ndi-ọlu-ubi ahu siritara onwe-ha, Nka bu onye-nketa; bianu, ka ayi b͕ue ya, ihe-nketa-ya gābu kwa nke ayi. 8 Ha we jide ya, b͕ue ya, tupu ya n'azu ubi-vine ahu. 9 Gini kwa ka onye-nwe ubi-vine ahu gēme? ọ gābia, la ndi-ọlu-ubi ahu n'iyì, were kwa ubi-vine ahu nye ndi ọzọ. 10 Ùnu agughi ọbuná ihe a edeworo n'akwukwọ nsọ; Nkume nke ndi nēwu ulo juru, Nke ahu ka emere isi nkuku ulo: 11 Ọ bu n'aka Onye-nwe-ayi ka nka sitere, Ọ bu kwa oké ọlu n'anya-ayi? 12 Ha we chọ uzọ ijide Ya; ma ha turu egwu ìgwè madu ahu; n'ihi na ha mara na Ọ turu ilu a imegide ha; ha we rapu Ya, la. 13 Ha we zigara Ye ufọdu nime ndi-Farisi na ndi Herod, ka ha we nwude Ya n'okwu. 14 Ha we bia, si Ya, Onye-ozizí, ayi amatawo na I bu onye ezi-okwu, na I dighi-asọ kwa onye ọ bula anya: n'ihi na I dighi-ele madu anya n'iru, kama I nēzi uzọ Chineke n'ezi-okwu: ò ziri ezi n'iwu itu ùtú nye Sisa, ma-ọbu na ò zighi ezi? 15 Àyi gātu, ma-ọbu na ayi agaghi-atu? Ma ebe Ọ matara iru-abua-ha; Ọ si ha, Gini mere unu nānwam? wetaram otù shilling, ka M'hu ya. 16 Ha we weta ya. Ọ si ha, Ònye nwe onyinyo a na ihe a edekwasiri ya? Ha si Ya, Sisa nwe. 17 Jisus we si ha, Nyeghachinu Sisa ihe nke Sisa, nyeghachi-kwa-nu Chineke ihe nke Chineke. O we ju ha nile anya nke-uku bayere Ya. 18 Ndi-Sadusi, ndi si na nbilite-n'ọnwu adighi, we biakute Ya; ha we jua Ya, si, 19 Onye-ozizí, Moses dere akwukwọ nye ayi, si, Ọ buru na nwa-nne-nwoke onye ọ bula anwua, rapu nwunye n'azu, ma ọ rapughi nwa, ka nwa-nne-ya nwoke kuru nwunye-ya, me ka nkpuru toputara nwa-nne-ya. 20 Umu-nne-ndikom asa di: nke-mbu luru nwunye, we nwua nārapughi nkpuru; 21 nke-abua we kuru ya, nwu kwa, ọ rapughi kwa nkpuru n'azu; nke-atọ otú ahu kwa: 22 ndikom asa ahu arapughi nkpuru. N'ikpe-azu ha nile nwanyi ahu nwu-kwa-ra. 23 Na nbilite-n'ọnwu, nwùnye onye n'etiti ha ka ọ gābu? n'ihi na ha asa nwere ya na nwunye. 24 Jisus siri ha, Ọ̀ bughi n'ihi nka ka unu ji hie uzọ, na unu amataghi ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, ma-ọbu ike Chineke? 25 N'ihi na mb͕e ha gēsi na ndi nwuru anwu bilie, ha alughi nwunye, enyeghi kwa ha n'ọlulu-di; kama ha di ka ndi-mọ-ozi di n'elu-igwe. 26 Ma n'okwu bayere ndi nwuru anwu, na anēme ka ha si n'ọnwu bilie; ùnu agughi n'akwukwọ Moses, n'ebe edere okwu bayere Osisi ntà, otú Chineke gwara ya, si, Mu onwem bu Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob? 27 Ọ bughi Chineke nke ndi nwuru anwu, kama Ọ bu nke ndi di ndu: unu onwe-unu nēhie uzọ nke-uku. 28 Otù onye nime ndi-ode-akwukwọ bia-kwa-ra, we nu ka ha nājurita onwe-ha ajuju, ma ebe ọ matara na Ọ zarari ha nke-ọma, ọ jua Ya, si, Òle nke bu nke-mbu n'ihe nile enyere n'iwu? 29 Jisus zara, si, Nke-mbu bu, Nuru, Israel; Onye-nwe-ayi, bú Chineke-ayi, Onye-nwe-ayi bu otù: 30 i gāhu kwa Onye-nwe-ayi, bú Chineke-gi, n'anya, site n'obi-gi dum, site kwa na nkpuru-obi-gi dum, site kwa n'uche-gi dum, site kwa n'ike-gi dum. 31 Nke-abua bu nke à, I gāhu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi. Ọ dighi ihe ọzọ enyere n'iwu nke dikariri ndia. 32 Ode-akwukwọ ahu we si Ya, Onye-ozizi, n'ezie I kwuru nke-ọma na Ọ bu otù; ọ dighi kwa chi ọzọ di ma-ọbughi Ya: 33 na ihu Ya n'anya site n'obi-gi dum, site kwa na nghọta-gi dum, site kwa n'ike-gi dum, na ihu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi, ọ kachasi àjà-nsuresi-ọku nile na àjà ọzọ nile nke-uku. 34 Mb͕e Jisus huru na ọ zara dika onye nwere uche, Ọ si ya, I nọghi ebe di anya n'ala-eze Chineke. Ma ọ dighi onye nwere anya-ike site na mb͕e ahu iju Ya ajuju. 35 Jisus we za, mb͕e Ọ nēzi ihe n'ulo uku Chineke, si, Ndi-ode-akwukwọ si aṅa kwu na Kraist ahu bu nwa Devid? 36 Devid onwe-ya siri nime Mọ Nsọ, Onye-nwe-ayi siri Onye-nwem, Nọdu ala n'aka-nrim, Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-Gi ka ihe-nb͕akwasi-ukwu nke ukwu-Gi abua. 37 Devid onwe-ya nākpọ Ya Onye-nwe-ya; òle ebe O si buru kwa Nwa-ya? Oké ìgwè madu ahu we were obi-utọ nu okwu-Ya. 38 N'ozizi-Ya Ọ si kwa, Lezienu anya ndi-ode-akwukwọ, ndi nāchọ ijeghari n'uwe-nwuda, na inara ekele n'ọma-ahia nile unu, 39 na isi oche nile n'ulo-nzukọ-unu, na isi ọnọdu nile n'oriri nile unu: 40 ndi nēripia ulo ndinyom di-ha nwuru, nēkpe kwa ogologo ekpere ka madu we hu ha anya; ndia gēnwe ezi ọmuma-ikpe gabigara ókè kari ndi ọzọ. 41 O we nọdu n'ulo uku Chineke na ncherita-iru ebe anēdebe ùtú anātu, O we nēle otú ìgwè madu nātubà ego n'ebe ùtú ahu: ọtutu ndi bu ọgaranya nātubà kwa ri nne. 42 Otù nwayi, bú ob͕enye, nke di-ya nwuru, we bia, tubà ego ntà abua, nke mere otù farthing. 43 O we kpọ ndi nēso uzọ-Ya ka ha biakute Ya, Ọ si ha, N'ezie asim unu, Nwanyi a, bú ob͕enye, nke di-ya nwuru, ọ tubàra kari ndi nile nātubà nime ebe ùtú ahu: 44 n'ihi na ha nile sitere n'inwebiga-àkù-ókè-ha tubà; ma nwanyi ahu sitere n'ukọ-ya tubà ka ihe nile nke o nwere ra, bú ihe dum o ji biri.

Mak 13

1 Mb͕e Ọ nāputa n'ulo uku Chineke, otù onye n'etiti ndi nēso uzọ-Ya we si Ya, Onye-ozizí, le aha nkume na aha owuwu-ulo ndia bu! 2 Jisus we si Ya, Ì huru oké owuwu-ulo ndia? Agaghi-arapu otù nkume ma-ọli n'ebe a n'elu nkume-ibe-ya, nke anāgaghi-akwatu n'ala. 3 Mb͕e Ọ nānọdu n'elu ugwu Olive na ncherita-iru ulo uku Chineke, Pita na Jemes na Jọn na Andru we jua Ya iche, si, 4 Gwa ayi, òle mb͕e ihe ndia gābu? gini gābu kwa ihe-iriba-ama mb͕e ọ bula agaje imezu ihe ndia nile? 5 Ma Jisus malitere isi ha, Lezienu anya ka onye ọ bula ghara iduhie unu. 6 Ọtutu madu gābia n'aham, si, Mu onwem bu Ya; ha gēduhie kwa ọtutu madu. 7 Ma mb͕e ọ bula unu gānu okwu agha di iche iche na akukọ agha di iche iche, unu atula ujọ: ihe ndia aghaghi iputa; ma ọgwugwu ihe nile akērughi. 8 N'ihi na mba gēbili imegide mba ọzọ, ala-eze gēbili kwa imegide ala-eze ọzọ: ala-ọma-jijiji gādi n'ebe di iche iche; oké unwu di iche iche gādi: ihe ndia bu nmalite ihe-nb͕u. 9 Ma unu onwe-unu lezie anya n'onwe-unu: n'ihi na ha gārara unu nye n'aka nnọkọ-ikpé di iche iche; n'ulo-nzukọ di iche iche ka agāpia kwa unu ihe; n'iru ndi-isi na ndi-eze ka unu gēguzo kwa n'ihim, iburu ha àmà. 10 Aghaghi kwa ibu uzọ kwusa ozi ọma nkem n'iru mba nile. 11 Ma mb͕e ọ bula ha duru unu je ikpé, rara kwa unu nye, unu ebula uzọ nēcheb͕u onwe-unu okwu unu gēkwu: kama okwu ọ bula agēnye unu n'oge hour ahu, kwuenu nke ahu: n'ihi na ọ bughi unu onwe-unu nēkwu, kama ọ bu Mọ Nsọ. 12 Nwa-nne gārara kwa nwa-nne-ya nye n'aka ọnwu, nna gārara kwa nwa-ya nye; umu gēbili kwa imegide ndi muru ha, me kwa ka ha nwua ọnwu. 13 Madu nile gākpọ kwa unu asì n'ihi aham: ma onye were ntachi-obi nọgide rue ọgwugwu ihe nile, onye ahu ka agazọputa. 14 Ma mb͕e ọ bula unu gāhu ihe-árú nke nākpata itọb͕ọrọ n'efu, ka ọ nēguzo n'ebe ọ nēkwesighi (onye nāgu, ya tugharia uche), mb͕e ahu ndi nọ na Judia, ka ha b͕alaga n'ugwu: 15 onye nọ kwa n'elu ulo, ya ghara iridata, ma-ọbu ibà nime, ikwapu ihe ọ bula n'ulo-ya: 16 onye nọ kwa n'ubi, ya ghara ilaghachi ichiri uwe-ya. 17 Ma ahuhu gādiri ndi di ime na ndi nēnye nwa ara na mb͕e ahu. 18 Ma kpenu ekpere ka ọ ghara idi na mb͕e oyi. 19 N'ihi na mb͕e ahu gābu nkpab͕u, nke aha nkpab͕u di otú a akādighi site na nmalite òkìkè-uwa nke Chineke kère rue mb͕e a, ọ gaghi-adi kwa ma-ọli. 20 Ọ buru kwa na Onye-nwe-ayi emeghi ubọchi ahu ka ha di nkpirikpi, agaghi-azọputa madu ọ bula: ma n'ihi ndi arọputara, ndi Ọ rọputara, O mere ka ubọchi ahu di nkpirikpi. 21 Mb͕e ahu ọ buru na onye ọ bula gāsi unu, Le, Kraist nọ n'ebe a; ma-ọbu, Le, n'ebe ahu; unu ekwela: 22 n'ihi na Kraist ugha di iche iche na ndi-amuma ugha gēbili, gosi kwa ihe-iriba-ama di iche iche na ọlu-ebube di iche iche, ka ha we duhie ndi arọputara, ma ọ buru na ọ gēkwe me. 23 Ma unu onwe-unu lezie anya: le, agwawom unu ihe nile mb͕e akēmeghi ha. 24 Ma na mb͕e ahu, mb͕e nkpab͕u ahu gasiri, anyanwu gāb͕a ọchichiri, ọnwa agaghi-enye kwa ihè-ya, 25 kpakpando nile ganāda kwa site n'elu-igwe, agēme kwa ka ike nile nke di n'elu-igwe me nkpatu. 26 Mb͕e ahu ha gāhu kwa Nwa nke madu ka Ọ nābia n'igwe-oji nile n'oké ike na ebube. 27 Mb͕e ahu Ọ gēzipu kwa ndi-mọ-ozi-Ya, me ka ndi nke Ya arọputara si n'ifufe anọ zukọ, site na nsọtu uwa rue nsọtu elu-igwe. 28 Ma site n'aru osisi fig mutanu ilu-ya: mb͕e ọ bula alaka-ya dibara nrò ub͕u a, pute kwa akwukwọ-ndu-ya, unu mara na mb͕e okpom-ọku di nso; 29 otú a unu onwe-unu kwa, mb͕e ọ bula unu gāhu ihe ndia ka ha nāputa, maranu na Ọ nọ nso, n'ọnu-uzo. 30 N'ezie asim unu, Ọb͕ọ a agaghi-agabiga ma-ọli, rue mb͕e ihe ndia nile gēme. 31 Elu-igwe na uwa gagabiga: ma okuwu nile nkem agaghi-agabiga ma-ọli. 32 Ma ọ dighi onye ọ bula matara ihe bayere ubọchi ahu ma-ọbu oge hour ahu, ọbuná ndi-mọ-ozi nke elu-igwe amat'aghi, Ọkpara ahu amataghi kwa, kama ọ bu nání Nnam matara. 33 Lezienu anya, murunu anya, nēkpe-kwa-nu ekpere: n'ihi na unu amataghi mb͕e oge ahu bu. 34 Ọ di ka mb͕e madu, onye jere inọdu n'ala ndi ọzọ, ebe ọ rapuru ulo-ya, nye kwa ndi-orù-ya ọlu ichi-isi, nye onye ọ bula nime ha ọlu-ya, o nye-kwa-ra onye-ọnu-uzọ iwu ka ọ che nche. 35 Ya mere, nēchenu nche: n'ihi na unu amataghi mb͕e Onye-nwe ulo gābia, ma ọ bu n'anyasi, ma-ọbu n'etiti abali, ma-ọbu mb͕e oke-ọkuku kwara, ma-ọbu n'ututu; 36 ka O we ghara ihu unu ka unu nāraru ura, ma ọ buru na Ọ bia na mberede. 37 Ma okwu M'nāgwa unu ka M'nāgwa madu nile, Nēchenu nche.

Mak 14

1 Ma ememe ngabiga na achicha ekoghi-eko gādi mb͕e ubọchi abua gasiri: ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ we nāchọ uzọ ha gēsi jide Ya n'aghughọ, b͕ue Ya: 2 n'ihi na ha nāsi, Ọ bughi n'ememe a, ka ùzù ndi-Ju we ghara idi ma eleghi anya. 3 Mb͕e Ọ nọ na Betani n'ulo Saimon onye-ekpenta, mb͕e Ọ nānọdu na nri, otù nwanyi we bia nke nēji ite alabaster, nke manu-otite ezi nard di oké ọnu-ahia nke-uku di ya; ọ kuwara ite ahu, we wusa manu-otite ahu n'isi-ya. 4 Ma ufọdu di ndi iwe nēwe nke-uku n'etiti ha, ha si, Àlawo manu-otite a n'iyì otú a iji me gini? 5 N'ihi na apuru ire manu-otite a kari ọgu shilling iri-na-ise, we nye ndi-ob͕enye. Ha we tamu ntamu megide nwanyi ahu. 6 Ma Jisus siri, Rapunu ya; gini mere unu nēsob͕u ya? ọ luru ọlu ọma n'arum. 7 N'ihi na unu nwere ndi-ob͕enye n'etiti unu mb͕e nile, mb͕e ọ bula unu chọrọ unu puru ime kwa ha ihe ọma: ma unu enweghi Mu onwem mb͕e nile. 8 O mere ihe ọ nwere ike ime: o buru uzọ te arum manu-otite ka ewe doziem n'olìlì. 9 Ma n'ezie asim unu, Ebe ọ bula agēkwusa ozi ọma nka n'uwa dum, agēkwuta kwa ihe nke nwanyi a mere, ka ọ buru ihe-ncheta-ya. 10 Judas Iskariot, onye nke bu otù nime ndi-ozi iri na abua ahu, we jekuru ndi-isi-nchu-àjà, ka o we rara Ya nye n'aka-ha. 11 Ma mb͕e ha nuru ya ha ṅuria ọṅu, we kwe nkwa inye ya ego. Ọ we nāchọ oghere o gēsi rara Ya nye. 12 N'ubọchi mbu nke achicha ekoghi-eko, mb͕e ha nāchu aja ngabiga, ndi nēso uzọ-Ya we si Ya, Òle ebe I nāchọ ka ayi je dozie ka I we rie oriri ngabiga? 13 O we zipu madu abua n'etiti ndi nēso uzọ-Ya, si ha, Jenu n'obodo a, otù nwoke nke bū ite miri gēzute kwa unu: sonu ya; 14 ebe ọ bula ọ gābà kwa, sinu nna-nwe ulo, Onye-ozizí si, Òle ebe ulo-ọbìa edeberem di, ebe Mu na ndi nēso uzọm gēri oriri ngabiga? 15 Ya onwe-ya gēgosi kwa unu ime-ulo uku di n'elu ulo akwadebeworo dozi kwa: n'ebe ahu dozienu ihe nye ayi. 16 Ndi ahu nēso uzọ-Ya we pua ba n'obodo, hu dika Ọ gwara ha-ri: ha we dozie ememe ngabiga. 17 Mb͕e o ruru anyasi Ya na ndi-ozi iri na abua ahu we bia. 18 Mb͕e ha nānọdu na nri nēri kwa ihe, Jisus we si, N'ezie asim unu, Otù onye si n'etiti unu puta gāraram nye, bú onye Mu na ya nēri ihe. 19 Ọ malitere iwuta ha, ha malite-kwa-ra isi Ya n'otù, Ọ̀ bu mu? 20 Ma Ọ siri ha, Ọ bu otù onye nime unu iri na abua, onye nke Mu na ya nēsukọ nri n'afere. 21 N'ihi na Nwa nke madu nāla, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ banyere Ya: ma ahuhu gādiri nwoke ahu onye anēsite n'aka-ya rara Nwa nke madu nye Ọ buru na amughi nwoke ahu ọ gādi ya nma. 22 Mb͕e ha nēri ihe, O we nara ob͕e achicha, gọzie ya, nyawa ya, nye ha, si, Naranu: nka bu arum. 23 O we nara iko, kele kwa, we nye ha: ha nile we ṅua nime ya. 24 O we si ha, Nka bu ọbaram nke ọb͕ub͕a-ndu, nke anāwusì n'ihi ọtutu madu. 25 N'ezie asim unu, M'gaghi-aṅu kwa ma-ọli n'ihe si n'osisi vine puta, rue ubọchi ahu mb͕e M'gāṅu ya ọhu n'ala-eze Chineke. 26 Mb͕e ha bùsiri abù, ha pua je ugwu Olive. 27 Jisus we si ha, Agēme ka unu nile ma n'ọnyà: n'ihi na edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, M'gētib͕u Onye-ọzùzù-aturu, agāb͕asa kwa aturu-Ya. 28 Ma mb͕e emere ka M'si n'ọnwu bilie, M'gēburu unu uzọ ga Galili. 29 Ma Pita siri Ya, Ọ buru na agēme ọbuná madu nile ka ha ma n'ọnyà, ma agaghi-eme mu onwem. 30 Jisus we si ya, N'ezie asim gi, na ta, bú n'abali a, mb͕e oke-ọkuku akākwaghi ákwá ub͕ò abua, i gāgọnaririn ub͕ò atọ. 31 Ma ọ nēkwusi ike nke-uku, si, Ọ buru na ọ di nkpà ka m'so Gi nwua, m'gaghi-agọnari Gi ma-ọli. Ọ bu kwa otú a ka ha nile kwuru. 32 Ha we biarue ogige nke aha-ya bu Getsemane: O we si ndi nēso uzọ-Ya, Nọdunu n'ebe a, rue mb͕e M'nēkpe ekpere. 33 O we kuru Pita na Jemes na Jọn tiyere Onwe-ya, ibobo we malite inwu Ya n'aru nke-uku, obi malite-kwa-ra ilọ Ya miri. 34 O we si ha, Ọ nēwuta nkpuru-obim nke-uku, rue ọnwu: nọgidenu n'ebe a, nēche-kwa-nu nche. 35 O we ga n'iru nke-ntà, da n'ala, we kpe ekpere ka oge hour ahu we gabiga Ya, ma ọ buru na ọ gēkwe me. 36 O we si, Aba, Nna, I puru ime ihe nile; naram iko a: ma ọ bughi ihe Mu onwem nāchọ, kama ihe Gi onwe-gi nāchọ. 37 O we bia, hu ha ka ha nāraru ura, O we si Pita, Saimon, ì nāraru ura? ì nweghi ike iche nche otù oge hour? 38 Nēchenu nche, nēkpe-kwa-nu ekpere, ka unu we ghara ibà n'ọnwunwa: mọ nke madu di ọku n'ezie, ma anu-aru adighi ike. 39 O we rapu ha je kwa ọzọ, kpe ekpere, nēkwu otù okwu ahu. 40 O we bia kwa ọzọ, hu ha ka ha nāraru ura, n'ihi na anya-ha di oké arọ́; ha amataghi kwa ihe ha gāza Ya. 41 O we bia ọbibia nke-atọ, si ha, Nārarunu ura site n'ub͕u a, nēzu-kwa-nu ike: o zuwo: oge hour nkem eruwo; le, anārara Nwa nke madu nye n'aka ndi-nmehie. 42 Bilienu, ka ayi je: le, onye nāraram nye nọ nso. 43 Ngwa ngwa, mb͕e Ọ kpu okwu n'ọnu, Judas, otù onye n'etiti ndi-ozi iri na abua ahu, biara, ya na ìgwè madu ndi chiri mma-agha na osisi, site n'ebe ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ na ndi-okenye nọ. 44 Ma onye nārara Ya nye nyere ha-ri ihe-iriba-ama, si, Onye ọ bula m'gēsutu ọnu, Onye ahu bu Ya; jidenu Ya, lezienu anya duru Ya je. 45 Mb͕e ọ biara, ngwa ngwa ọ biakutere Ya, si, Rabai; o we sutu Ya ọnu nke-uku. 46 Ha we tukwasi Ya aka, jide Ya. 47 Ma otù onye n'etiti ndi guzoro nso miputara mma-agha-ya, b͕u orù onye-isi-nchu-àjà mma, bipu nti-ya. 48 Jisus we za, si ha, Ùnu putara chiri mma-agha na osisi ijidem, dika imegide onye nāpunara madu ihe? 49 Kwa-ubọchi Mu na unu nọ n'ulo uku Chineke ebe M'nēzí ihe, ma unu ejideghm: ma emere nka ka ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ we mezu. 50 Ha nile we rapu Ya, b͕alaga. 51 Ma otù okorọbia sonyere Ya, onye b͕okwasiri ezi ákwà ọcha n'aru ọtọ ya: ha we jide ya: 52 ma ọ rapuru ezi ákwà ọcha ahu, b͕ara ọtọ, b͕alaga. 53 Ha we si n'ebe ahu duru Jisus jekuru onye-isi-nchu-àjà: ha nile, bú ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye na ndi-ode-akwukwọ, we b͕akọ n'ebe ọ nọ. 54 Pita soro kwa Ya-ri n'ebe di anya, rue nime ulo, nime obí onye-isi-nchu-àjà; ọ nānọdu kwa n'etiti ndi nēje ozi, ọ nānya ọku n'ihè ọku. 55 Ma ndi-isi-nchu-àjà na nnọkọ-ikpé dum nāchọ àmà imegide Jisus ime ka Ọ nwua; ma ha achọtaghi. 56 N'ihi na ọtutu madu nāb͕a àmà ugha imegide Ya, àmà-ha abughi kwa otù. 57 Ufọdu we bilie, b͕a àmà ugha megide Ya, si, 58 Ayi onwe-ayi nuru ka Ọ nāsi, Mu onwem gākwatu ulo nsọ a nke ejiri aka me, n'ubọchi atọ M'gēwu kwa ulo ọzọ nke anējighi aka me. 59 Ọbuná otú a àmà-ha abughi kwa otù. 60 Onye-isi-nchu-àjà we bilie n'etiti, jua Jisus, si, Ì zaghi ihe ọ bula? gini bu àmà madu ndia nāb͕agide Gi? 61 Ma O kpuchiri ọnu, ọ dighi kwa ihe ọ bula Ọ zara. Onye-isi-nchu-àjà juba-kwa-ra Ya ọzọ, si Ya, Gì onwe-gi bu Kraist ahu, Ọkpara nke Onye ahu agọziri agọzi? 62 Jisus we si, Mu onwem bu Ya: unu gāhu kwa Nwa nke madu ka Ọ nānọdu n'aka-nri nke ike, nābia kwa, Ya na igwe-oji nile nke elu-igwe. 63 Onye-isi-nchu-àjà we dọwa uwe-ya nile, si, Ọ̀ bu nkpà ndi-àmà gini nākpa ayi ọzọ? 64 Unu nuru nkwulu ahu: gini bu uche-unu? Ha nile we ma Ya ikpé, si na O kwesiri inwu ọnwu. 65 Ufọdu we malite ibusa Ya ọnu-miri, na ikechi iru-Ya, na iti Ya aka, na isi Ya, Bu amuma: ndi nēje ozi we nara Ya n'ipia Ya ihe. 66 Mb͕e Pita nọ n'okpuru n'obí, otù nime umu-ab͕oghọ ndi nējere onye-isi-nchu-àjà ozi we bia: 67 mb͕e ọ huru Pita ka ọ nānya ọku, o we le ya anya, si, Gi onwe-gi na Onye Nazaret ahu, bú Jisus, nọ-kwa-ra. 68 Ma ọ gọrọ, si, Amataghm, aghọtaghm kwa ihe gi onwe-gi nēkwu: o we pua je n'uzọ-nbata. 69 Nwa-ab͕ọghọ ahu we hu ya, malite kwa ọzọ isi ndi guzoro nso, Nwoke a bu otù onye nime ha. 70 Ma ọ gọ-kwa-ra ọzọ. Mb͕e nwa oge gasiri ndi guzoro nso we si kwa Pita ọzọ, N'ezie i bu otù onye nime ha; n'ihi na i bu kwa onye Galili. 71 Ma ọ malitere idu ikwù, na iṅu iyí, si, Amataghm Nwoke a Onye unu nēkwu. 72 Ngwa ngwa oke-ọkuku we kwa ákwá nke ub͕ò abua. Pita we cheta okwu ahu, otú Jisus siri ya, Mb͕e oke-ọkuku akākwaghi ub͕ò abua, i gāgọnarim ub͕ò atọ. Mb͕e ọ tulere okwu a n'obì o we kwa ákwá.

Mak 15

1 Ngwa ngwa n'ututu ndi-isi-nchu-àjà, ha na ndi-okenye na ndi-ode-akwukwọ, na nnọkọ-ikpé dum, b͕ara ìzù, we ke Jisus ab͕u, kupu Ya je, rara Ya nye n'aka Pailat. 2 Pailat we jua Ya, si, Gi onwe-gi bu Eze ndi-Ju? O we za ya, si, Gi onwe-gi kwuru. 3 Ndi-isi-nchu-àjà we nēbo Ya ọtutu ebubo. 4 Pailat we ju kwa Ya ọzọ, si, Ì zaghi ihe ọ bula? le ka ọtutu ihe ha nēbo Gi ra. 5 Ma Jisus azaghi ihe ọ bula ọzọ; ya mere na o juru Pailat anya. 6 Ma n'ememe ọ nārapuru ha otù onye-nkpọrọ, onye ha nāriọ n'aka-ya. 7 Ma otù onye di anākpọ Barabas, onye ekereri ab͕u, ya na ndi biliri imegide ndi-isi, madu ndi b͕u-kwa-ra madu na nbili ahu. 8 Ìgwè madu ahu we rigo, malite iriọ ya ka o me dika ọ nēmere ha. 9 Pailat we za ha, si, Ùnu nāchọ ka m'rapuru unu Eze ndi-Ju? 10 N'ihi na ọ mara na ndi-isi-nchu-àjà rara Ya-ri nye n'ihi ekworo. 11 Ma ndi-isi-nchua-àjà kwaliri ìgwè madu ahu, ka ọ rapuru-ha Barabas kari Jisus. 12 Ma Pailat za kwa-ra ọzọ, si ha, Ọ̀ bu gini ka m'gēme kwa Onye ahu unu nākpọ Eze ndi-Ju? 13 Ma ha ti-kwa-ra nkpu ọzọ, si, Kpọgide Ya n'obe. 14 Pailat we si ha, É-è, n'ihi na Ò mere ihe ọjọ gini? Ma ha tibigara nkpu ókè, si, Kpọgide Ya n'obe. 15 Ma Pailat, ebe ọ nēzube ime ihe gātọ ìgwè madu ahu utọ n'obi, ọ rapuru ha Barabas, o we rara Jisus nye, mb͕e ọ piasiri Ya ihe, ka ewe kpọgide Ya n'obe. 16 Ndi-agha we dupu Ya ga ba n'obí, nke bu Pritoriọm; ha we kpọkọ òtù- ha dum. 17 Ha we yikwasi Ya uwe ododo; mb͕e ha kpasiri okpu-nmeri nke eji ogwu me, ha were ya kpube Ya n'isi; 18 ha we malite ikele Ya, si, Ekele, Eze ndi-Ju! 19 Ha were kwa amì nēti Ya n'isi, ha nābusa kwa Ya ọnu-miri, ha we b͕ue ikperè nākpọ isi ala nye Ya. 20 Mb͕e ha mesiri Ya ihe-ọchì, ha we yipu Ya uwe ododo ahu, we yikwasi Ya uwe-Ya nile. Ha we dupu Ya ka ha kpọgide Ya n'obe. 21 Ha we jide otù onye nke nāgabiga ka o so ha, ka o we būru obe-Ya, bú Saimon onye Sairini, nna Aleksanda na Rufọs, nke si n'azu obodo ahu bia. 22 Ha we kuru Ya bia n'ebe anākpọ Gọlgọta, nke bu, ma asugharia ya, Ebe okpokoro-isi. 23 Ha we che n'iru Ya manya-vine nke agwara myrrh: ma Ọ naraghi ya. 24 Ha we kpọgide Ya n'obe, kè kwa uwe-Ya n'etiti ha, nēfe nzà n'elu ha, nke onye ọ bula gēwe. 25 Ma ọ bu oge hour nke-atọ, ha we kpọgide Ya n'obe. 26 Edekwasi-kwa-ra ndekwasi nke ihe eboro Ya, EZE NDI-JU. 27 Ha kpọgide-kwa-ra ndikom abua tinyere Ya ndi nāpunara madu ihe; otù onye n'aka-nri-Ya, na otù onye n'aka-ekpe-Ya. 28 Ewe mezue ihe edere n'akwukwọ nsọ, nke si, Ọ bu kwa na ndi nēmebi iwu ka aguru Ya. 29 Ndi nāgabiga nēkwulu kwa Ya, nēfufe isi-ha, nāsi kwa, Ehe! Gi Onye nākwatu ulo nsọ ayi, Onye nēwu kwa ya n'ubọchi atọ, 30 zọputa Onwe-gi, si n'elu obe ridata. 31 Otú ahu ka ndi-isi-nchu-àjà nēkwu kwa, ebe ha na ndi-ode-akwukwọ nēme Ya ihe-ọchì n'etiti onwe-ha, si, Ọ zọputara ndi ọzọ; Ọ pughi izọputa Onwe-ya. 32 Ka Kraist, Eze Israel, si n'elu obe ridata ub͕u a, ka ayi we hu kwere kwa. Ndi akpọgidere Ya na ha n'obe nāta kwa Ya uta. 33 Mb͕e o ruru oge hour nke-isi, ọchichiri we b͕a n'ala ahu dum rue oge hour nke-iteghete. 34 N'oge hour nke-iteghete Jisus we were oké olu tie nkpu, si, Eloi, Eloi, lama sabaktani? nke bu, ma asugharia ya, Chinekem, Chinekem, gini mere I ji rapu nání Mu? 35 Ufọdu n'etiti ndi guzoro nso, mb͕e ha nuru ya, ha we si, Le, Ọ nākpọ Elaija 36 Otù onye we b͕a ọsọ, were manya-vine b͕ara uka b͕aju sponge, tukwasi ya n'amì, nye Ya ka Ọ ṅua, si, Rapunu; ka ayi hu ma Elaija nābia iwedata Ya n'obe. 37 Ma Jisus mere ka olu-Ya dasie ike, O we kubìe ume. 38 Ákwà-nb͕ochi nke ulo nsọ Chineke we b͕awa iberibe abua site n'elu rue ala. 39 Ma mb͕e ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, nke guzoro nso na ncherita-iru Ya, huru na O kubìri ume otú a, ọ si, N'ezie Nwoke a bu Ọkpara Chineke. 40 Ndinyom di kwa ndi nọ n'ebe di anya nēkiri: n'etiti ha ka Meri Magdalini, na Meri nne Jemes nke-ntà na Joses, na Salomi, nọ; 41 ndi nēso Ya mb͕e Ọ nọ na Galili, nēje-kwa-ra Ya ozi; na ọtutu ndinyom ọzọ ndi soro Ya rigoro Jerusalem. 42 Mb͕e o ruru anyasi ub͕u a, ebe ọ bu Nkwadebe, nke bu ubọchi buru ubọchi-izu-ike uzọ, 43 Josef nke Arimatia we bia, onye bu onye-nnọkọ-ikpé onye anāsọpuru, onye ya onwe-ya nēche kwa ala-eze Chineke; o were anya-ike bakuru Pailat, riọ aru Jisus. 44 O we ju Pailat anya ma ọ buru na Ọ nwuruwori: o we kpọ ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise biakute ya, ọ jua ya ma ọ di anya mb͕e Ọ nwuru. 45 Mb͕e ọ matara site n'ọnu ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise, o we rara ozu Jisus nye Josef n'efu. 46 O we zuta ezi ákwà ọcha; mb͕e o budatasiri Ya, o we ke Ya n'ezi ákwà ọcha ahu, tọb͕ọ Ya n'ílì nke egwuwarari n'oké nkume; o we kpọre otù nkume kwachie ọnu-uzọ ílì ahu. 47 Ma Meri Magdalini na Meri nne Joses huru ebe atọb͕ọrọ Ya.

Mak 16

1 Mb͕e ubọchi-izu-ike gasiri, Meri Magdalini, na Meri nne James, na Salomi, we zuta uda utọ di iche iche, ka ha we bia te Ya manu. 2 N'isi-ututu n'ubọchi mbu nke ízù ubọchi asa, ha we bia rue ílì-Ya mb͕e anyanwu wara. 3 Ha we sirita onwe-ha, Ònye gākpọrepuru ayi nkume ahu n'ọnu-uzọ ílì? 4 Mb͕e ha lere anya n'elu, ha we hu na akpọreghachiwo nkume ahu: n'ihi na o riri nne nke-uku. 5 Ha we ba n'ílì, hu nwa-okorọbia ka ọ nọduru n'aka-nri, b͕okwasi kwa uwe-nwuda ọcha; ibobo we nwua ha n'aru nke-uku. 6 Ma ọ si ha, Ka ibobo ghara inwu unu n'aru nke-uku: unu nāchọ Jisus, Onye Nazaret, Onye akpọgideworo n'obe: emere ka O si n'ọnwu bilie; Ọ nọghi n'ebe a: le, ebe ha tọb͕ọrọ Ya! 7 Kama labanu, si ndi nēso uzọ-Ya na Pita, O buru unu uzọ ga Galili: n'ebe ahu ka unu gāhu Ya, dika Ọ gwara unu. 8 Ha we pua, si n'ílì ahu b͕alaga; n'ihi na ọma-jijiji na njubiga-anya-ókè nānwu ha n'aru: ha agwaghi kwa onye ọ bula ihe ọ bula; n'ihi na ha nātu egwu. 9 Ma mb͕e O siri n'ọnwu bilie n'ututu n'ubọchi mbu nke ízù ubọchi asa, O buru uzọ were Onwe-ya gosi Meri Magdalini, onye Ọ chupururi mọ ọjọ asa nime ya. 10 Nwanyi ahu we ga kọrọ ndi Ya na ha nọri, mb͕e ha nēru újú nākwa kwa ákwá. 11 Ma mb͕e ndi ahu nuru na Ọ di ndu, na ya onwe-ya hu-kwa-ra Ya-ri, ha ekweghi. 12 Ma mb͕e ihe ndia gasiri emere ka Ọ puta ìhè nye madu abua nime ha n'udi di iche, mb͕e ha nēje ije, nāga n'azu obodo. 13 Ndi ahu we je kọrọ ndi fọduru: ha ekweghi kwa okwu-ha. 14 Emesia emere ka Ọ puta ìhè nye ndi-ozi iri na otù onwe-ha mb͕e ha nọduru na nri; O we ta ekweghi-ekwe-ha na obi-etili-ha uta, n'ihi na ha ekweghi okwu ndi huru Ya mb͕e emesiri ka O si n'ọnwu bilie. 15 O we si ha, Ganu n'uwa nile, kwusara ihe nile ekère èkè ozi ọma nkem. 16 Onye nke kwere, nke eme-kwa-ra ya baptism, agāzọputa ya; ma agāma onye nke nēkweghi ikpé. 17 Ihe-iriba-ama ndia gēso kwa ndi kwere: n'aham ka ha gāchupu ndi-mọ ọjọ; ha gēkwu okwu n'asusu ọhu di iche iche; 18 ha gāchilite agwọ, ọ buru kwa na ha aṅua ihe ọ bula nēbute ọnwu, ọ gaghi emeru ha aru ma-ọli; ha gēbikwasi ndi-nriaria aka, agēme kwa ka aru-ha di ike. 19 Ya mere, otú a, mb͕e Ọ gwasiri ha okwu, ewe kuru Onye-nwe-ayi Jisus rigo n'elu-igwe, O we nọdu n'aka-nri nke Chineke. 20 Ndi ahu we pua, kwusa ebe nile, Onye-nwe-ayi nēso kwa ha n'ilu ọlu, nēme okwu-ha ka o guzosie ike site n'ihe-iriba-ama di iche iche nke nēso. Amen.

Luk 1

1 Ebe ọtutu madu tinyere aka-ha ide akwukwọ banyere ihe ahu nke emezuworo n'etiti ayi, 2 ha dere ihe ndi mbu ji anya ha hu ihe ndia burukwa ndi na-ekwuputa ozioma, gwara ayi, 3 ọ di-kwa-ram nma, ebe m'soro ihe nile nke-ọma site na mbu, ka m'dere gi ka o si me, Teọfilọs di oké ebube; 4 ka i we mata na ihe nile ejiworo okwu ọnu zí gi bu ihe kwesiri itukwasi obi. 5 N'ubọchi Herod, eze Judia, otù onye-nchu-àjà di, aha-ya bu Zakaraias, nke si n'òtù obodo Abaija puta: o nwe-kwa-ra nwunye nke si n'etiti umu-nwanyi Eron puta; aha nwayi ahu bu Elizabet. 6 Ha abua bu ndi ezi omume n'iru Chineke, nāga n'ihe nile Onye-nwe-ayi nyere n'iwu na n'ihe nile Ọ guru n'ihe ziri ezi nādighi ita uta. 7 Ha ejighi kwa nwa, n'ihi na Elizabet bu nwanyi-àgà, ha abua aghọwo kwa agadi. 8 Ma o rue, mb͕e ọ nālu ọlu nchu-àjà n'iru Chineke dika ha si-eme kwa ubochi, 9 dika omume ọlu nchu-àjà nādi, ọlu ibà n'ulo nsọ nke Onye-nwe-ayi na isure ihe-nsure-ọku nēsì isì utọ ruru ya site n'ife nzà. 10 Ọra ndi-Ju nile nēkpe kwa ekpere n'èzí n'oge hour isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ. 11 Ewe me ka ọ hu mọ-ozi Onye-nwe-ayi ka o guzoro n'aka-nri ebe-ichu-àjà ebe a na-eme ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ. 12 Mb͕e Zakaraias huru ya obi we lọ ya miri, ọ tu-kwa-ra egwu. 13 Ma mọ-ozi ahu siri ya, Atula egwu, Zakaraias: n'ihi na a nuwo aririọ-gi, nwunye-gi Elizabet gāmu-kwa-ra gi nwa-nwoke, i gākpọ kwa aha-ya Jọn. 14 I gēnwe kwa ọṅù na obi-utọ; ọtutu madu gāṅuri kwa ọṅu n'ọmumu-ya. 15 N'ihi na ọ gābu onye uku n'anya Onye-nwe-ayi, ọ gaghi-aṅu kwa manya-vine na ihe-ọṅuṅu nābà n'anya ma-ọli; agēme kwa ka o juputa na Mọ Nsọ, ọbuná site n'afọ nne-ya. 16 Ọtutu madu nime umu Israel ka ọ gēme kwa ka ha chigharikwute Onye-nwe-ayi Chineke-ha. 17 Ya onwe-ya gāga kwa n'iru Ya nime mọ na ike Elaija, ime ka obi ndi bu nna chigharikute umu-ha, ime kwa ka ndi nānughi ihe chigharia iga n'uche ndi ezi omume; idozi nye Onye-nwe-ya otù ndi nke akwadebeworo Ya. 18 Zakaraias we si mọ-ozi ahu, Òle ihe m'gēji mara nka? n'ihi na mu onwem bu agadi, nwunyem aghọwo kwa agadi. 19 Mọ-ozi ahu we za, si ya, Mu onwem bu Gebriel, onye nēguzo n'iru Chineke; ezite-kwa-ram igwa gi okwu, na izì gi ozi ọma ndia. 20 Le kwa, i gēkpuchi ọnu, i gaghi-apu kwa ikwu okwu, rue ubọchi ahu mb͕e ihe ndia gēme, n'ihi na i kweghi okwum ndia, nke gēmezu n'oge-ha. 21 Ndi-Ju we nēle anya Zakaraias, o ju-kwa-ra ha anya n'ebe ọ nānọ ọdù n'ulo nsọ. 22 Ma mb͕e ọ putara, ọ pughi igwa ha okwu: ha we mara na ọ hururi ọhù n'ulo nsọ: ya onwe-ya we nēfere ha aka, nānọgide kwa n'ob͕i. 23 O we rue, mb͕e ubọchi ifè-òfùfè-ya zuru, na ọ lara n'ulo-ya. 24 Ma mb͕e ubọchi ndia gasiri Elizabet nwunye-ya turu ime; o we zobe onwe-ya ọnwa ise, si, 25 Otú a ka Onye-nwe-ayi meworo nyem n'ubochi O ji lem anya, iwepu ita-utam n'etiti madu. 26 Ma n'ọnwa nke isi ezigara mọ-ozi ahu, bú Gebriel, site n'ebe Chineke nọ je obodo nke Galili, anākpọ aha-ya Nazaret, 27 jekuru nwa-ab͕ọghọ nā-maghi nwoke, onye ekwere na otù nwoke si n'ulo Devid puta, onye aha-ya bu Josef, gālu ya; aha nwa-ab͕ọghọ ahu bu Meri. 28 O we bata n'ebe ọ nọ, si, Ekele, gi onye Chineke meworo ka i nara amara, Onye-nwe-ayi nọyere gi. 29 Ma obi lọrọ ya miri nke-uku n'okwu-ya, o we nātule n'uche-ya aha ekele okwu a gābu. 30 Mọ-ozi ahu we si ya, Atula egwu, Meri: n'ihi na Chineke mere gi amara. 31 Le kwa, i gāturu ime, muta Nwa-nwoke, kpọ aha-Ya Jisus. 32 Nwa-nwoke ahu gābu onye uku, agākpọ kwa Ya Ọkpara nke Onye kachasi ihe nile elu: Onye-nwe-ayi Chineke gēnye kwa Ya oche-eze nna-Ya Devid: 33 Ọ gābu kwa eze ulo Jekob rue mb͕e ebighi-ebi; ala-eze-Ya agaghi-agwu kwa agwu. 34 Meri we si mọ-ozi ahu, Ìhe a gēsi aṅa me, ebe ọ dighi nwoke m'mara? 35 Mọ-ozi ahu we za, si ya, Mọ Nsọ gābiakwasi gi, ike nke Onye kachasi ihe nile elu gēkpuchi kwa gi: n'ihi nka Ihe di nsọ nke i di ime Ya, agākpọ Ya Ọkpara Chineke. 36 Le kwa, Elizabet onye-ikwu-gi, ya onwe-ya aturuwo kwa ime nwa-nwoke n'agadi-ya: nke a bu kwa ọnwa nke-isi ya, bú onye anākpọ nwanyi-àgà. 37 N'ihi na ọ dighi okwu ọ bula si Chineke n'ọnu puta nke nāgaghi-adi irè. 38 Meri we si, Le, abum orù-nwanyi nke Onye-nwe-ayi; ya dirim ka okwu-gi si di. Mọ-ozi ahu we pua n'ebe ọ nọ. 39 Ma Meri biliri na mb͕e ahu, ga elu-ala ọsọsọ, bà n'otù obodo nke Juda; 40 we ba n'ulo Zakaraias, kele kwa Elizabet. 41 O we rue, mb͕e Elizabet nuru ekele Meri, nwa-ya wuliri n'afọ-ya; Elizabet we juputa na Mọ Nsọ; 42 o we welie olu-ya tisie nkpu ike, si, Gi onwe-gi bu onye agọziri agọzi n'etiti ndinyom, ọ bu kwa onye agọziri agọzi ka nkpuru nke afọ-gi di. 43 Òle ebe ka nka si kwa rum, na nne Onye-nwem gābiakutem? 44 N'ihi na lee, mb͕e olu ekele-gi ruru na ntim, nwam wuliri n'afọm n'obi-utọ. 45 Ngọzi nādi-kwa-ra nwanyi ahu nke kwere na ihe ndia gēmezu, bú nke agwaworo ya site n'ọnu Onye-nwe-ayi. 46 Meri we si, Nkpuru-obim nēme ka Onye-nwe-ayi di uku, 47 Ọ nātọ kwa mọm utò nke-uku na Chineke, bú Onye-nzọputam. 48 N'ihi na O lere ọnọdu di ala nke orù-Ya nwanyi anya: N'ihi na le, site n'ub͕u a ọb͕ọ nile gākpọm onye ngọzi diri. 49 N'ihi na Onye di ike emewom ihe uku di iche iche; Aha-Ya di kwa nsọ. 50 Ebere-Ya di-kwa-ra ndi nātu egwu YaRue ọb͕ọ na ọb͕ọ. 51 O werewo ogwe-aka-Ya gosi ike; Ọ chusawo ndi-npako n'èchìchè nke obi-ha. 52 O wedawo ndi di ike pua n'oche-eze-ha, Weli kwa elu ndi ọnọdu-ha di ala. 53 O werewo ezi ihe nile nyeju ndi agu nāgu afọ; Zipu kwa ndi-ọgaranya n'aka efu. 54 O nyeworo Israel nwa-Ya aka, Ka O we cheta ebere 55 (Dika Ọ gwara nna-ayi-hà)N'ebe Abraham na nkpuru-ya nọ rue mb͕e ebighi-ebi. 56 Meri we nọyere ya ihe dika ọnwa atọ, we laghachi n'ulo-ya. 57 Ma oge Elizabet zuru ka ọ gāmuta nwa; o we mua nwa-nwoke. 58 Ndi-ab͕ata-obi-ya na ndi-ikwu-ya we nu na Onye-nwe-ayi mere ka ebere-Ya di uku n'ebe ọ nọ; ha we so ya ṅuri ọṅu. 59 O we rue n'ubọchi nke-asato, na ha biara ibi nwatakiri ahu úgwù; ha we kpọbá ya Zakaraias, n'aha nna-ya. 60 Nne-ya we za, si, mba; kama agākpọ ya Jọn. 61 Ha we si ya, Ọ dighi onye ọ bula n'etiti ndi-ikwu-gi nke anākpọ aha nka. 62 Ha we fere nna-ya aka, ihe ọ chọrọ ka akpọ ya. 63 O we riọ ha ka ha nye ya ihe eji ede akwukwọ, o we de, si, Aha-ya bu Jọn. O we ju ha nile anya. 64 Ngwa ngwa ọnu-ya we saghe, ire-ya tọpu kwa, o we nēkwu okwu, nāgọzi Chineke. 65 Ndi nile bi ha gburugburu we tua egwu: ewe kwusa okwu ndia nile n'elu-ala Judia dum. 66 Ndi nile nke nuru ha we debe ha n'obi-ha, si, Àha madu gini kwa ka nwatakiri a gābu? N'ihi na aka Onye-nwe-ayi diyere ya. 67 Nna-ya Zakaraias we juputa na Mọ Nsọ, o we bu amuma, si, 68 Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Onye-nwe-ayi, Chineke nke Israel; N'ihi na O letawo ndi-Ya, lu-kwa-ra ha ọlu nb͕aputa, 69 O weliwo-kwa-ra ayi mpi nke nzọputaN'ulo onye nējere Ya ozi, bú Devid 70 (Dika O kwuru site n'ọnu ndi-amuma-Ya di nsọ site n'oge mbu), 71 Nzọputa n'aka ndi-iro-ayi, na n'aka ndi nile nākpọ ayi asì; 72 Imere nna-ayi-hà ebere, Na icheta ọb͕ub͕a-ndu nsọ Ya; 73 Iyí Ọ ṅuru Abraham nna-ayi, 74 Ikweye ayi, ebe adọputaworo ayi n'aka ndi-iro-ayi, Ka ayi nēkpere Ya nātughi egwu. 75 N'obi ọcha na ezi omume n'iru Ya ubọchi-ayi nile. 76 Ọzọ kwa, gi onwe-gi, nwatakiri, agākpọ gi onye-amuma nke Onye kachasi ihe nile elu: N'ihi na i gāga n'iru Onye-nwe-ayi idozi uzọ-Ya nile; 77 Ime ndi nke Ya ka ha mara nzọputaNime nb͕aghara nmehie nile ha, 78 N'ihi obi ebere nke Chineke-ayi, Nke ọwuwa-anyanwu nke sitere n'elu gēleta ayi nime ya, 79 Imukwasi ndi nọ n'ọchichiri na onyinyo ọnwu ìhè; Iduzi ukwu-ayi ba n'uzo udo. 80 Nwatakiri ahu we nētọ, nēsi kwa ike na mọ-ya, o we nọ n'ọhia rue ubọchi ewere ya gosi Israel.

Luk 2

1 Ma o rue na mb͕e ahu, iwu si n'ebe Sisa Ọgọstọs nọ puta na agēde aha madu nile bi n'elu-uwa dum madu bi n'akwukwo. 2 Nka bu odide-aha mbu edere mb͕e Kwiriniọs bu onye nāchi Siria. 3 Madu nile we ga ka ede aha-ha n'akwukwọ, onye ọ bula ọ ga obodo nke aka ya. 4 Josef we si kwa na Galili, site n'obodo Nazaret, rigo na Judia, ba n'obodo Devid nke anākpọ Betlehem, n'ihi na o si n'ulo na agburu Devid puta; 5 ka o we me ka ede aha ya na Meri n'akwukwọ, bú nwanyi ekwere na ọ gālu, onye di kwa ime. 6 O we rue, mb͕e ha nọ n'ebe ahu, ubọchi-ya zuru ka ọ gāmuta nwa. 7 O we muta Nwa-nwoke mbu ya; o we ke Ya n'ákwà ọkiké, nyibe Ya n'ihe anētiye nri anu-ulo, n'ihi na uzọ adighi nye ha n'ulo ndi-ije. 8 Ndi-ọzùzù-aturu di n'otù ala ahu nānọ n'ọhia, nēche kwa ìgwè aturu-ha n'abali. 9 Mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi we guzo ha nso, ebube nke Onye-nwe-ayi muba-kwa-ra ha gburugburu: ha we tua egwu nke-uku. 10 Mọ-ozi ahu we si ha, Unu atula egwu; n'ihi na le, anamezì unu ozi ọma nke oké ọṅù nke gādiri ndi Israel nile: 11 n'ihi na ta n'obodo Devid ka amuru nye unu Onye-nzọputa, Nke bu Kraist Onye-nwe-ayi. 12 Nka gābu-kwa-ra unu ihe-iriba-ama-Ya; Unu gāhu Nwa ọhu ekere n'ákwà ọkiké, nēdina kwa n'ihe anētiye nri anu-ulo. 13 Na mberede ìgwè usu ndi-mọ-ozi nke elu-igwe we nọyere mọ-ozi ahu, nēto Chineke, si, 14 Otuto diri Chineke n'ebe kachasi ihe nile elu, Udo di kwa n'elu uwa n'etiti madu ndi ihe-ha di Ya ezi nma. 15 O we rue, mb͕e ndi-mọ-ozi puru n'ebe ha nọ la n'elu-igwe, ndi-ọzùzù-aturu we sirita onwe-ha, Ka ayi je rue Betlehem ub͕u a, hu ihe a ekwuru, nke Onye-nwe-ayi mere ka ayi mara. 16 Ha we were ọsọ bia, hu Meri na Josef, na Nwa ọhu ahu ka O dinara n'ihe ahu anētiye nri anu-ulo. 17 Ma mb͕e ha huru ya, ha me ka amara okwu agwara ha-ri bayere Nwatakiri ahu. 18 Okwu ndi-ọzùzù-aturu gwara ha we ju ndi nile nuru ha anya. 19 Ma Meri debere ihe ndia nile ekwuru, nātughari ha n'obi-ya. 20 Ndi-ọzùzù-aturu we laghachi, nēnye Chineke otuto, nēto kwa Ya n'ihi ihe nile ha nuru na nke ha huru, dika agwara ha. 21 Mb͕e ubọchi asatọ zuru ibì Ya úgwù, ewe kpọ aha-Ya Jisus, nke mọ-ozi kpọrọ ya mb͕e akātughi ime Ya. 22 Mb͕e ubọchi nile nke ime ha ka ha di ọcha dika iwu nke Moses si di zuru, ha we kuru Ya rigoro Jerusalem, iche Ya n'iru Onye-nwe-ayi 23 (dika edeworo ya n'iwu Onye-nwe-ayi, Nwa mbu ọ bula nke bu oke nke meghere àkpà-nwa, agākpọ ya ihe nsọ nye Onye-nwe-ayi), 24 na inye ihe-ichu-àjà dika okwu ekwuworo n'iwu Onye-nwe-ayi si di, Nduru abua, ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua. 25 Ma le, otù nwoke nọ na Jerusalem, onye aha-ya bu Simeon; nwoke a bu kwa onye ezi omume na onye nātu egwu Chineke, nēche nkasi-obi nke Israel: Mọ Nsọ di kwa n'aru ya. 26 Mọ Nsọ duru ya-ri ọdu, na ọ gaghi-ahu ọnwu, rue mb͕e ọ gāhu Kraist nke Onye-nwe-ayi. 27 O we bia na Mọ ahu nime ulo uku Chineke: mb͕e ndi muru Ya kubatara Nwatakiri ahu, bú Jisus, ka ha we mere Ya dika omume iwu Chineke si di, 28 ya onwe-ya we nara Ya nke-ọma, kuru Ya n'aka-ya, gọzi kwa Chineke, si, 29 Onye-nwem, ub͕u a ka I gārapu orù-Gi ka ọ laN'udo, dika okwu-Gi si di; 30 N'ihi na anyam ahuwo nzọputa-Gi, 31 Nke I doziri n'iru ndi nile; 32 Ìhè agēkpughere mba nile ọzọ, Na ebube ndi-Gi, bú Israel. 33 Ihe ekwuru bayere Ya we nēju kwa nna-Ya na nne-Ya anya; 34 Simeon we gọzie ha, si kwa Meri nne-Ya, Le, edowo Nwa nka ka Ọ buru ọdida na nbili nke ọtutu madu n'Israel; ka Ọ buru kwa ihe-iriba-ama anēkwu okwu megide; 35 ma mma-agha gāduwa kwa nkpuru-obi gi onwe-gi; ka ewe kpughe èchìchè nke si n'ọtutu obi puta. 36 Otù onye anākpọ Ana di kwa, bú onye-amuma-nwanyi, nwa-nwanyi Fanuel, nke si n'ebo Asha puta (nwanyi a aghọwo ezi agadi, ebe ya na di-ya biri arọ asa site na nwa-ab͕ọghọ-ya, 37 o we nọdu n'ọnọdu nwanyi di-ya nwuru rue ọgu arọ anọ na anọ), onye nāpughi n'ulo Chineke, ma o were obubu-ọnu na aririọ nēkpere Chineke abali na ehihie. 38 O we bia rue ebe ahu n'otù oge hour ahu, we kele Chineke, gwa kwa ndi nile nēche nb͕aputa nke Jerusalem okwu bayere Ya. 39 Mb͕e ha mezuru ihe nile nke di ka iwu Onye-nwe-ayi si di, ha we laghachi na Galili, rue obodo nke aka ha, bú Nazaret. 40 Nwatakiri ahu we nētó, nēsi kwa ike, nējuputa n'amam-ihe: amara Chineke di kwa n'aru Ya. 41 Ndi muru Ya nēje Jerusalem kwa-arọ n'ememe ngabiga. 42 Mb͕e Ọ b͕ara arọ iri na abua, ha we rigo dika omume nke ememe ahu si di; 43 mb͕e ha nọzuru ubọchi nile, mb͕e ha nālaghachi, Nwa-okoro ahu, bú Jisus, we nọdu n'azu na Jerusalem; ndi muru Ya amaghi kwa ya; 44 ma ebe ha chère na Ọ di n'usu-ha, ha jere ije otù ubọchi; ha nachọ kwa Ya n'etiti ndi-ikwu-ha na ndi ha mara: 45 mb͕e ha nāchọtaghi Ya, ha we laghachi na Jerusalem, nāchọ Ya. 46 Ọ we rue, mb͕e ubọchi atọ gasiri, ha hu Ya n'ulo Chineke, ka Ọ nọduru n'etiti ndi-ozizí, nānu okwu-ha, nāju kwa ha ajuju: 47 ibobo nghọta-Ya na ọziza nile Ya we nwua ndi nile nuru okwu-Ya n'aru. 48 Mb͕e ha huru Ya, egwu wee tua ha n'aru: nne-Ya we si Ya, Nwam, Gini mere I meso ayi otú a? le, nna-Gi na mu onwem nāchọ Gi n'obi ufu. 49 O we si ha, Gini mere unu nāchọm? ùnu amataghi na aghaghm idi n'ihe nke Nnam? 50 Ma ha onwe-ha aghọtaghi okwu Ọ gwara ha. 51 O we so ha rida, bia rue Nazaret; Ọ we nọdu n'okpuru ha: nne-Ya we nēdebe ihe nile ekwuru n'obi-ya. 52 Jisus we nāga n'iru n'amam-ihe na ogologo, nāga kwa n'amara n'ebe Chineke na madu nọ.

Luk 3

1 Ma n'arọ nke-iri-na-ise n'ọchichi nke Taibiriọs Sisa, mb͕e Pọntiọs Pailat bu onye nāchi Judia, mb͕e Herod bu kwa tetrarch nke Galili, mb͕e nwa-nne-ya Filip bu kwa tetrarch nke ala Ituria na Trakonaitis, mb͕e Lisanias bu kwa tetrarch nke Abilini, 2 mb͕e Anas na Kaiafas bu ndi-isi-nchu-àjà, okwu Chineke biakutere Jọn nwa Zakaraias n'ọhia. 3 O we bia n'ala nile di Jọ̀dan gburugburu, nēkwusa baptism nke nchèghari, ka ewe b͕aghara nmehie; 4 dika edeworo ya n'akwukwọ okwu Aisaia onye-amuma, si, Olu otù onye nēti nkpu n'ọhia, si, Dozienu uzọ Onye-nwe-ayi, Menu okporo-uzọ-Ya ka ha guzozie. 5 Agēkpoju ndagwurugwu ọ bula, Agēme kwa ka ugwu ọ bula na ugwu ntà ọ bula di ala; Ebe di nb͕agọ gāghọ kwa ebe guzoziri eguzozi, Ebe nile di nkputankpu gābu kwa uzọ di lari; 6 Madu nile gāhu kwa nzọputa Chineke. 7 Ya mere ọ si ìgwè madu ahu ndi biara ka ọ me ha baptism, Unu umu nke aju-ala, ònye gosiri unu ka unu b͕anari iwe gaje ibia? 8 Ya mere mianu nkpuru kwesiri nchèghari-unu, unu amalite-kwa-la ikwu nime onwe-unu, si, Ayi nwere Abraham na nna: n'ihi na asim unu, na Chineke puru ime ka umu tolitere Abraham site na nkume ndia. 9 Ma ọbuná ub͕u a anātukwasi kwa anyu-ike na nkpọrọgwu osisi nile; ya mere anēb͕utu osisi ọ bula nke nāmighi nkpuru ọma, tubà kwa ya nime ọku. 10 Ìgwè madu ahu we jua ya, si, Ọ̀ bu kwa gini kwesiri ka ayi me? 11 O we za, si ha, Onye nwere uwe-ime abua, ya me onye nēnweghi ka o keta; onye nwekwara nri, ya mee otú ahu. 12 Ndi-ọna-utu biakwara ka eme ha baptism, ha we si ya, Onye-ozizí, gini kwesiri ka ayi me? 13 Ọ si ha, Unu apunarala madu kari ihe akaworo unu. 14 Ndi-agha nēje ozi jukwara ya, si, Ayi onwe-ayi kwa, gini kwesiri ka ayi me? Ọ si ha, Unu ejidela onye ọ bula aka ike, ebokwala onye ọ bula ebubo ugha; ka afọ ju kwa unu n'ego-ọlu-unu. 15 Mb͕e ndi-Ju nọ nēle anya, mb͕e madu nile nātughari kwa n'obi-ha ihe bayere Jọn, ma eleghi anya ya onwe-ya bu Kraist ahu, 16 Jọn zara, si ha nile, Mu onwem nēji miri me unu baptism n'ezie; ma Onye kam ike nābia, Onye m'nērughi itọpu eriri akpukpọ-ukwu-Ya: Onye ahu gēji Mọ Nsọ na ọku me unu baptism: 17 Onye ihe-ifucha-ọka-Ya di n'aka-Ya, ifuchapu ebe-nzọcha-ọka-Ya nke-ọma, na ikpokọta ọka-Ya n'ọba-Ya; ma Ọ gēji ọku anāpughi imenyu emenyu rechapu ib͕ob͕o. 18 Ya mere o ji ọtutu ndumọdu di iche iche zì ndi-Ju ozi ọma; 19 ma Herod, bú tetrarch, ebe Jọn turu ya nmehie-ya n'anya, bú ihe bayere Herodias nwunye nwa-nna-ya, na ihe bayere ajọ ihe nile Herod mere, 20 ọ tukwasi-kwara nka n'elu ihe nile, na o mechibidoro Jọn n'ulo-nkpọrọ. 21 Ma mb͕e emere ndi-Ju nile baptism, o rue, mb͕e emesikwara Jisus baptism, mb͕e Ọ nēkpe kwa ekpere, na emeghere elu-igwe, 22 Mọ Nsọ we fedakwasi Ya n'oyiyi aru, dika nduru, olu we site n'elu-igwe, si, Gi onwe-gi bu Ọkparam M'huru n'anya; ihe-Gi dim ezi mma. 23 Ma Jisus onwe-ya, mb͕e Ọ malitere izí ihe, Ọ b͕ara ihe dika orú arọ na iri, buru Nwa Josef (dika echère), nwa Hili, 24 nwa Matat, nwa Livai, nwa Melkai, nwa Janai, nwa Josef, 25 nwa Matataias, nwa Emos, nwa Nehum, nwa Esli, nwa Nagai, 26 nwa Meath, nwa Matataias, nwa Semein, nwa Josek, nwa Joda, 27 nwa Joanan, nwa Risa, nwa Zerubabel, nwa Shealtiel, nwa Nirai, 28 nwa Melkai, nwa Adai, nwa Kosam, nwa Elmadam, nwa Ia, 29 nwa Jisus, nwa Elieza, nwa Jorim, nwa Matat, nwa Livai, 30 nwa Simeon, nwa Judas, nwa Josef, nwa Jonam, nwa Elaiakim, 31 nwa Melea, nwa Mena, nwa Matata, nwa Netan, nwa Devid, 32 nwa Jesi, nwa Obed, nwa Boaz, nwa Salmon, nwa Nahshon, 33 nwa Aminadab, nwa Admin, nwa Anai, nwa Hezron, nwa Perez, nwa Juda, 34 nwa Jekob, nwa Aisak, nwa Abraham, nwa Tira, nwa Nehoa, 35 nwa Serug, nwa Reu, nwa Peleg, nwa Iba, nwa Shela, 36 nwa Kainan, nwa Afaksad, nwa Shem, nwa Noa, nwa Lemek, 37 nwa Metusela, nwa Inok, nwa Jered, nwa Mahalaleel, nwa Kenan, 38 nwa Enos, nwa Set, nwa Adam, nwa Chineke.

Luk 4

1 Ma ebe Jisus juputara na Mọ Nsọ, O si na Jọdan laghachi, Mọ ahu we duru Ya nāgaghari n'ọhia, 2 ekwensu nānwà kwa Ya ọgu ubọchi abua. O righi kwa ihe ọ bula n'ubọchi ahu: mb͕e ubọchi ahu zuru, agu we gua Ya. 3 Ekwensu we si Ya, Ọ buru na I bu Ọkpara Chineke, gwa nkume a ka ọ ghọ ob͕e achicha. 4 Jisus we za ya, si, Edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ọ bughi nání achicha ka madu gēji di ndu. 5 Ọ we duru Ya rigo, we gosi Ya ala-eze nile nke elu-uwa dum madu bi na nkenke oge. 6 Ekwensu we si Ya, Gi ka m'gēnye ike a nile, na ebube-ha: n'ihi na ararawo ya nye n'akam; onye ọ bula m'chọ-kwa-ra inye ya m'nye ya. 7 Ya mere ọ buru na Gi onwe-gi gākpọ isi ala n'irum, ihe a nile gābu nke Gi. 8 Jisus we za, si ya, Edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye-nwe-ayi Chineke-gi ka i gākpọ isi ala nye, ọ bu kwa nání Ya ka i gēkpere. 9 O we duru Ya ga Jerusalem, guzo Ya n'elu akuku ulo uku Chineke, si Ya, Ọ buru na I bu Ọkpara Chineke, si n'ebe a tuda Onwe-gi n'ala: 10 n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ndi-mọ-ozi-Ya ka Ọ gēnye iwu bayere gi: 11 Ọzọ, Ọ bu kwa n'elu aka-ha ka ha gēburu gi, Ka i ghara ikpọbì ukwu-gi na nkume ma eleghi anya. 12 Jisus we za, si ya, Ekwuwo, si, Anwala Onye-nwe-ayi Chineke-gi. 13 Mb͕e ekwensu nwasiri ọnwunwa nile, o we si n'ebe Ọ nọ pua rue mb͕e ọzọ. 14 Jisus we laghachi na Galili n'ike Mọ Nsọ: ùdé-Ya we pua jesa n'ala dum di buruburu. 15 Ya onwe-ya we nēzí ihe n'ulo-nzukọ nile ha, madu nile nēnye kwa Ya otuto. 16 O we bia rue Nazaret, ebe azuputara Ya, O we ba n'ulo-nzukọ-ha n'ubọchi-izu-ike, dika Ọ nēme mb͕e dum, O we bilie igu akwukwọ. 17 Ewe nye Ya akwukwọ Aisaia onye-amuma n'aka. Ó we meghe akwukwọ ahu, chọta ebe edeworo ya, si, 18 Mọ nke Onye-nwe-ayi di n'arum. N'ihi na O terem manu izì ndi-ob͕enye ozi ọma: O ziteworom ikwusa ọrira gwa ndi adọtara n'agha, Na ikwusa ihu-uzọ gwa ndi-ìsi, Izipu ndi etihiawara aru ka ha la, 19 Ikwusa arọ mb͕e Onye-nwe-ayi nānara madu nke-ọma. 20 O we kpuchie akwukwọ ahu, were ya nyeghachi onye nējere ha ozi, we nọdu ala: ndi nile nọ n'ulo-nzukọ ahu we nēlegide Ya anya. 21 O we malite isi ha, Ta ka emezuworo ihe a edeworo n'akwukwọ nsọ na nti-unu. 22 Ha nile we buru ndi-àmà-Ya, okwu nile nke amara nke si n'ọnu-Ya puta nēju kwa ha nile anya: ha we si, Onye a, Ọ̀ bughi Nwa Josef? 23 O we si ha, N'ezie unu gaturu m ilu a, Dibia, me ka aru Gi onwe-gi di ike: ka ihe ayi nuru na emere ha na Kapanaum ra, me kwa otú a n'ebe a n'obodo nke aka Gi. 24 O we si, N'ezie asim unu, Ọ dighi onye-amuma ọ bula nke anara nke-ọma n'obodo nke aka ya. 25 Ma n'ezie ka M'nāsi unu, Ọtutu ndinyom di-ha nwuru di n'ala Israel n'ubọchi Elaija, mb͕e emechiri elu-igwe arọ atọ na ọnwa isi, mb͕e oké unwu dara n'ala ahu nile; 26 ma ọ dighi onye ọ bula nime ha ezigara Elaija, kama nání Zarefat, n'ala Saidon, jekuru nwanyi di-ya nwuru. 27 Ọtutu ndi-ekpenta di kwa n'Israel na mb͕e Elaisha onye-amuma; ma ọ dighi onye ọ bula nime ha emere ka ọ di ọcha, kama nání Neamam onye Siria. 28 Ọnuma we juputa ha nile n'ulo-nzukọ ahu, mb͕e ha nuru okwu ndia; 29 ha we bilie, chupu Ya n'obodo ahu, duru Ya ga rue mpempe ugwu nke ewuru obodo-ha n'elu ya, ka ha we kwada Ya n'ala. 30 Ma Ya onwe-ya gabigara n'etiti ha la. 31 O we ridata na Kapanaum, otù obodo nke Galili, O we nēzi ha ihe n'ubọchi-izu-ike: 32 ibobo ozizí-Ya we nwua ha n'aru; n'ihi na okwu-Ya di ike. 33 Otù nwoke nọ kwa n'ulo-nzukọ-ha, nke nwere mọ ọjọọ; o we were oké olu tisie nkpu ike, si, 34 pua ebe a! ginl ka ayi na Gi nwekọrọ, Jisus Onye Nazaret? Ì biara ila ayi n'iyì? amataram, Onye I bu, Onye Nsọ ahu nke Chineke. 35 Jisus we bara ya nba, si, Kpuchie ọnu-gi, si kwa nime ya puta. Mb͕e mọ ọjọ ahu tudasiri ya n'ala n'etiti ha, o we si nime ya puta, nēmerughi ya aru. 36 Ibobo we nwua ha nile n'aru, ha we kwurita n'etiti onwe-ha, si, Gini bu okwu a? n'ihi na O ji ichi-isi na ike nye ndi-mọ nādighi ọcha iwu, ha we puta. 37 Ùzù-Ya we tua gazue n'ebe nile nke ala di obodo ahu gburugburu. 38 O we si n'ulo-nzukọ ahu bilie, ba n'ulo Saimon. Ma oké aru-ọku jisiri nne nwunye Saimon ike; ha we kpe ekpere banyere ya. 39 O we guzo n'akuku ya, bara aru-ọku ahu nba; aru-ọku ahu we rapu ya: ngwa ngwa o we bilie nēje-kwa-ra ha ozi. 40 Ma mb͕e anyanwu nāda, ndi nile, ka ha ra, bú ndi nwere madu aru nādighi nma n'ọria di iche iche, kuru ha biakute Ya; O we bikwasi ha nile n'otù n'otù aka-Ya abua, me kwa ka aru di ha ike. 41 Ndi-mọ ọjọ puta-kwa-ra n'ọtutu madu, nēti nkpu, si, Gi onwe-gi bu Ọkpara Chineke. Ma Ọ nābara ha nba, O kweghi kwa ka ha kwue okwu, n'ihi na ha matara na Ya bu Kraist. 42 Ma mb͕e chi bọrọ, Ọ pua ga n'ebe bu ọhia: igwè madu nile we nāchọ Ya, we biakute Ya, malite kwa ib͕ochi Ya, ka Ọ ghara isi na nke ha ga ebe ọzọ. 43 Ma Ọ siri ha, Aghaghm izì kwa obodo nile ọzọ ozi ọma ala-eze Chineke: n'ihi na eziterem ime nka. 44 O nēkwusa kwa okwu Chineke n'ulo-nzukọ nile nke Galili.

Luk 5

1 Ma o rue, mb͕e ìgwè madu nādagide Ya nānu kwa okwu Chineke, na Ya onwe-ya nēguzo n'usọ ọdọ-miri Genesaret; 2 O we hu ub͕ọ abua ka ha guzoro n'usọ ọdọ-miri ahu: ma ndi-ọkù esiwori nime ha pua, ha nāsa kwa ihe ha ji eb͕u azù. 3 O we ba n'otù nime ub͕ọ abua ahu, nke bu nke Saimon, we kpere ya ka o si n'ala nupu nke-ntà. O we nọdu, si n'ub͕ọ nēzí ìgwè madu nile ihe. 4 Ma mb͕e O kwubìri okwu, Ọ si Saimon, Nupu n'ob͕u-miri, wunyenu ihe unu ji eb͕u azù ka unu b͕ue azù. 5 Saimon we za, si, Nna-ayi, ayi dọb͕uru onwe-ayi n'ọlu ogologo abali a dum, ma ayi eb͕utaghi ihe ọ bula: ma n'okwu-Gi m'gāwuye ihe eji eb͕u azù. 6 Mb͕e ha mesiri nka, ha we nwuta oké ìgwè azù, ihe-ha eji eb͕u azù we nādọka; 7 ha we fere ndi-nketa-ibe-ha aka, bú ndi nọ n'ub͕ọ-ha ọzọ, ka ha bia nyere ha aka. Ha we bia, b͕ujue ub͕ọ̀ abua ahu, ya mere ha malitere imìkpu. 8 Ma mb͕e Saimon Pita huru ya, o we da n'ala n'ikperè Jisus, si, Si n'ebe m'nọ pua; n'ihi na abum onye-nmehie, Onye-nwe-ayi. 9 N'ihi na ibobo ob͕ub͕u azù ha b͕uru nwuru ya na ndi nile ya na ha nọ n'aru; 10 otú ahu ka ibobo nwu-kwa-ra Jemes na Jọn, umu Zebedi, n'aru, ndi ha na Saimon bu ndi-nnweko. Jisus we si Saimon, Atula egwu; site n'ub͕u a i ganānwuta madu na ndu. 11 Mb͕e ha tinyere ubọ-ha n'ala, ha we rapu ihe nile, so Ya. 12 O rue, mb͕e Ọ nọ n'otù nime obodo ahu, le, otù nwoke nke ekpenta juputara n'aru: ma mb͕e ọ huru Jisus o da kpuchie iru-ya n'ala, riọ Ya, si, Onye-nwe-ayi, ọ buru na I nāchọ, I puru ime ka m'di ọcha. 13 O we setipu aka-Ya, metu ya, si, Anamachọ; ka eme ka i di ọcha. Ngwa ngwa ekpenta ahu we rapu ya. 14 Ya onwe-ya we nye ya iwu ka ọ ghara igwa onye ọ bula: Ọ si kwa ya, Kama laba, were onwe-gi gosi onye-nchu-àjà, che kwa n'iru Chineke ihe bayere ime gi ka i di ọcha, dika Moses nyere n'iwu, ka ọ buru ha àmà. 15 Ma okwu bayere Ya fesakariri nke-uku: oké ìgwè madu we nāb͕akọ inu okwu-Ya, ka ewe me kwa aru-ha nke nādighi nma ka ọ di ike. 16 Ma Ya onwe-ya nēwezuga Onwe-ya n'ebe bu ọhia, nēkpe kwa ekpere. 17 O rue n'otù nime ubọchi ahu, na Ya onwe-ya nēzi ihe; ndi-Farisi na ndi-ozizí iwu Moses nānọ kwa Ya nso, ndi siri n'obodo ntà nile nke Galili na Judia na Jerusalem puta: ike nke Onye-nwe-ayi diye-kwa-ra Ya ime ka aru di madu ike. 18 Ma le, ndikom butere otù nwoke akuku-aru-ya nwuru anwu n'elu ihe-ndina: ha we nāchọ uzọ ibubata ya, na itọb͕ọ ya n'iru Ya. 19 Ebe ha nāhughi uzọ ha gēsi bubata ya n'ihi ìgwè madu ahu, ha we rigo n'elu ulo, we si n'okpukpu ulo buda ya na ute-ya n'etiti n'iru Jisus. 20 Mb͕e Ọ huru okwukwe-ha, Ọ si, Nwoke, ab͕agharawo gi nmehie-gi nile. 21 Ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi we malite itule n'obi-ha, si, Ònye bu Nwoke a nke nēkwu okwu nkwulu? Ònye puru ib͕aghara nmehie, ma-ọbughi nání Chineke? 22 Ma ebe Jisus mazuru ihe ha nātule n'obi-ha, Ọ za, si ha, Gini mere unu nātule ihe n'obi-unu? 23 Òle nke ka nfé, isi, Ab͕agharawo gi nmehie-gi nile; ma-ọbu isi, Bilie, jeghari kwa? 24 Ma ka unu we mata na Nwa nke madu nwere ike n'elu uwa ib͕aghara nmehie (Ọ si onye ahu ukwu-ya nwuru anwu), M'si gi, Bilie, chiri ute-gi, laa n'ulọ gi. 25 Ngwa ngwa o we bilie n'iru ha, chiri ihe o ji dina, je ulo-ya, nēto Chineke. 26 Ibobo we nwua ha nile n'aru, ha we to Chineke; egwu juputa-kwa-ra ha n'obi, ha si, Ayi ahuwo ihe-ebube ta. 27 Mb͕e ihe ndia gasiri Ọ pua, hu onye-ọna-utu, nke anākpọ aha-ya Livai, ka ọ nọduru n'ulo-ùtú, Ọ si ya, Som. 28 O we rapu ihe nile, bilie, so Ya. 29 Livai we siere Ya nri uku n'ulo-ya iji nara Ya nke-ọma: oké ìgwè ndi-ọna-utu na ndi ọzọ di kwa ndi soro ha nọdu na nri. 30 Ndi-Farisi na ndi-ode-akwukwọ-ha we tamube imegide ndi nēso uzọ-Ya, si, N'ìhi gini ka unu nēso ndi-ọna-utu na ndi-nmehie ndia nēri ihe? 31 Jisus we za, si ha, Nkpà dibia akpaghi ndi aru di nma; kama ọ nākpa ndi aru nādighi nma. 32 Abiaghm ikpọ ndi ezi omume kama ọ bu ndi-nmehie ka ha chègharia. 33 Ha we si Ya, Ndi nēso uzọ Jọn nēbu ọnu ọtutu mb͕e, nāriọ kwa aririọ; otú ahu ka ndi nēso uzọ ndi-Farisi nēme kwa; ma ndi nke Gi nēri nāṅu kwa. 34 Ma Jisus siri ha, Ọ̀ gābu na unu puru ime ka umu-ndikom nke ulo anālu nwunye ọhu bue ọnu, mb͕e ha na Onye nālu nwunye ọhu nānọ? 35 Ma ubọchi gābia; mb͕e agānapu kwa ha Onye nālu nwunye ọhu, mb͕e ahu ka ha gēbu ọnu n'ubọchi ahu. 36 O we tu-kwa-ra ha ilu, si, Ọ dighi onye ọ bula nādọkapu iberibe ákwà ọb͕ub͕a n'uwe ọhu tukwasi ya n'uwe ochie; eme otú a, ọ gādọka nke-ọhu, ọzọ kwa, iberibe ákwà ọb͕ub͕a si n'uwe ọhu ahu puta agaghi-adabà na nke-ochie. 37 Ọ dighi kwa onye ọ bula nāb͕aye manya-vine ọhu na karama-akpukpọ ochie; eme otú a, manya-vine ọhu gāb͕awa karama-akpukpọ, manya onwe-ya gāwusì, karama-akpukpọ ahu gāla kwa n'iyì. 38 Ma aghaghi ib͕aye manya-vine ọhu na karama-akpukpọ ọhu. 39 Ọzọ kwa, ọ dighi onye ọ bula, mb͕e ọ ṅuworo manya-vine ochie, nāchọ nke-ọhu: n'ihi na ọ si, Nke-ochie di nma.

Luk 6

1 O rue na Ọ nāga n'etiti ubi ọka n'ubọchi-izu-ike; ndi nēso uzọ-Ya we nāghọ oko ọka, nāta, nāmazu ha n'aka-ha. 2 Ma ufọdu nime ndi-Farisi siri, Gini mere unu nēme ihe nēzighi ezi n'iwu ime n'ubọchi-izu-ike? 3 Jisus we za ha, si, Ùnu agughi ọbuná ihe a, nke Devid mere, mb͕e agu guru ya, ya onwe-ya na ndi soro ya; 4 otú ọ batara n'ulo Chineke, were kwa ob͕e achicha anēche n'iru Chineke rie ya, o we nye kwa ndi ya na ha yikọ; nke nēzighi ezi n'iwu ka ha rie, ma nání ndi-nchu-àjà ka o ziri ezi? 5 O we si ha, Nwa nke madu bu Onye-nwe ubọchi-izu-ike. 6 O we rue n'ubọchi-izu-ike di iche, na Ọ batara n'ulo-nzukọ-ha, we nēzí ihe: otù nwoke nọ kwa n'ebe ahu, aka-nri-ya kpọnwu-kwa-ra akpọnwu. 7 Ma ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi nēche Ya, ma Ọ gēme ka aru-ya di ike n'ubọchi-izu-ike; ka ha we hu ihe ha gēji bo Ya ebubo. 8 Ma Ya onwe-ya matara ihe ha nātule n'obi; O we si nwoke ahu aka-ya kpọnwuru akpọnwu, Bilie, guzo n'etiti. O we bilie, guzo kwa. 9 Jisus we si ha, Anamaju unu, Ò ziri ezi n'iwu ime ezi ihe, ma-ọbu ime ihe ọjọ, n'ubọchi-izu-ike? ìzọ̀puta ndu, ma-ọbu ila ya n'iyì? 10 Mb͕e Ọ lesiri ha nile anya gburugburu, O we si ya, Setipu aka-gi. O we me ya: ewe me ka aka-ya di ka ọ di na mbu. 11 Ma ndi ahu juputara n'enweghi-uche; ha we nēkwurita n'etiti onwe-ha ihe ha gēme Jisus. 12 O rue n'ubọchi ndia, na Ọ puru rigo n'ugwu ahu ikpe ekpere; O we nọgide n'ogologo abali ahu nile n'ikpe ekpere nye Chineke. 13 Mb͕e chi bọrọ, Ọ kpọ ndi nēso uzọ-Ya biakute Ya: O we rọputa nime ha madu iri na abua, ndi Ọ kpọ-kwa-ra aha-ha ndi-ozi; 14 Saimon, onye Ọ kpọ-kwa-ra aha-ya Pita, na Andru nwa-nne-ya, na Jemes na Jọn, na Filip na Batọlọmiu, 15 na Matiu na Tomas, na Jemes nwa Alfiọs, na Saimon onye anākpọ Zilotis, 16 na Judas nwa Jemes, na Judas Iskariot, onye ghọrọ onye rara ya nye; 17 O we so ha rida, guzo n'ebe di lari, Ya na oké ìgwè ndi nēso uzọ-Ya, na oké ọtutu ndi- Ju ndi si na Judia nile na Jerusalem, na usọ oké osimiri nke Taia na Saidon, puta, ndi biara inu okwu-Ya, na ka ewe me ka aru-ha di ike n'ọria-ha nile; 18 eme-kwa-ra ka aru-ha di ike, bú ndi mọ nādighi ọcha nēsob͕u. 19 Ìgwè madu ahu nile we chọ imetu Ya aka: n'ihi na ike nēsi n'aru-Ya puta, nēme kwa ka aru di ha nile ike. 20 Ya onwe-ya we welie anya-Ya elu le ndi nēso uzọ-Ya, si, Ngọzi nādiri unu, bú ndi-ob͕eye: n'ihi na ala-eze Chineke bu nke unu. 21 Ngọzi nādiri unu ndi agu nāgu ub͕u a: n'ihi na afọ gēju unu. Ngọzi nādiri unu ndi nākwa ákwá ub͕u a: n'ihi na unu gāchì ọchì. 22 Ngọzi nādiri unu, mb͕e ọ bula madu gākpọ unu asì, mb͕e ọ bula ha gēkewapu kwa unu, ta kwa unu uta, tufu kwa aha-unu dika ajọ ihe, n'ihi Nwa nke madu. 23 Ṅurianu ọṅu n'ubọchi ahu, wuli-kwa-nu elu n'ihi ọṅù: n'ihi na le, ugwọ-ọ́lu-unu di uku n'elu-igwe: n'ihi na otú ahu ka ndi bu nna-ha mere ndi-amuma. 24 Ma ahuhu gādiri unu ndi-ọgaranya: n'ihi na unu nēnwezu nkasi-obi-unu. 25 Ahuhu gādiri unu, ndi afọ juworo ub͕u a: n'ihi na agu gāgu unu. Ahuhu gādiri unu, ndi nāchì ọchì ub͕u a: n'ihi na unu gēru újú kwa kwa ákwá. 26 Ahuhu gādiri unu, mb͕e ọ bula madu nile gēkwu okwu ọma bayere unu: n'ihi na otú ahu ka ndi bu nna-ha mere ndi-amuma ugha. 27 Ma asim unu ndi nānu okwum, Nāhunu ndi-iro-unu n'anya, nēmenu ihe ọma nye ndi nākpọ uṅu asì, 28 nāgọzinu ndi nābu unu ọnu, nēkpe ekpere nye ndi nākpali unu. 29 Onye ọ bula nke nēti gi aka n'otù ǹti, che-kwa-ra ya nke-ọzọ; onye nānapu kwa oké uwe-gi, eb͕ochila ya inara kwa uwe-ime-gi. 30 Nēnye onye ọ bula nāriọ gi; onye nānapu gi ihe-gi, ariọkwala ha n'aka-ya ọzọ. 31 Dika unu nāchọ kwa ka madu mere unu, unu onwe-unu nēme kwa ha otú ahu. 32 Ọ buru kwa na unu ahú ndi ahu n'anya, bú ndi nāhu unu n'anya, àha ekele gini diri unu? n'ihi na ọbuná ndi-nmehie nāhu ndi ahu n'anya, bú ndi nāhu ha n'anya. 33 Ọ buru kwa na unu eme ezi ihe nye ndi nēme ezi ihe nye unu, àha ekele gini diri unu? n'ihi na ọbuná ndi-nmehie nēme otù ihe ahu. 34 Ọ buru kwa na unu ewere ihe binye ha, bú ndi unu nēle anya na unu gānata n'aka-ha, àha ekele gini diri unu? ọbuná ndi-nmehie nēwere ihe binye ndi-nmehie, ka ha we nara kwa nke ra ka ya. 35 Ma nāhunu ndi-iro-unu n'anya, nēme-kwa-nu ezi ihe nye ha, nēbinye kwa ihe, ghara iwepu itukwasi-obi; ugwọ-ọlu-unu gādi kwa uku, unu gābu kwa umu nke Onye kachasi ihe nile elu: n'ihi na Ya onwe-ya nwere iru-ọma n'ebe ndi nēnweghi ekele na ndi bu ajọ madu nọ. 36 Nwenu obi-ebere, dika Nna-unu nwere obi-ebere. 37 Ọzọ, unu ekpela ikpé, agaghi-ekpe kwa unu ikpé ma-ọli: unu amakwala ikpé, agaghi-ama kwa unu ikpé ma-ọli: rapunu, agārapu kwa unu: 38 nēnyenu, agēnye kwa unu; ọtùtù ọma, nke abiadaworo ala, yọkọta, nke nējubiga kwa ókè, ka ha gēnye n'obi-unu. N'ihi na ihe unu ji tù ihe ka agēji tùkwara unu ọzọ. 39 O we tukwara ha ilu, si, Ònye-ìsì puru idu onye-ìsì? hà abua agaghi-adabà n'olùlù? 40 Onye nēso uzọ onye-ozizí adighi-aka onye-ozizí-ya: ma onye ọ bula mb͕e emere ya ka o zue okè gādi ka onye-ozizí-ya. 41 Ma gini mere i ji le irighiri ahihia nke di n'anya nwa-nna-gi, ma i tugharighi uche na ntuhie nke di n'anya nke gi? 42 Ma-ọbu ì si aṅa pu isi nwa-nna-gi, Nwa-nnam, kwe ka m'tupu irighiri ahihia ahu nke di n'anya-gi, mb͕e gi onwe-gi nāhughi ntuhie nke di n'anya nke gi? Onye-iru-abua, buru uzọ tupu ntuhie ahu n'anya nke gi, mb͕e ahu ka i gēlegide anya itupu irighiri ahihia ahu nke di n'anya nwa-nna-gi. 43 N'ihi na ọ dighi osisi ọma ọ bula nke nāmi nkpuru nābaghi n'ihe; ọzọ kwa, ọ dighi osisi ọ bula nābaghi n'ihe nke nāmi nkpuru ọma. 44 N'ihi na amara osisi ọ bula site na nkpuru nke aka ya. N'ihi na madu adighi-ekpokọta mkpuru fig site n'ogwu, ha adighi-aghọta kwa nkpuru-vine site n'obi-ogwu. 45 Ezi madu site n'ezi àkù nke obi-ya nēweputa ezi ihe; ajọ madu site kwa n'ajọ àkù nke obi-ya nēweputa ajọ ihe: n'ihi na ọnu-ya nēkwu okwu site n'ihe nke obi nwebigara ókè. 46 Ma gini mere unu nākpọm, Onye-nwe-ayi, Onye-nwe-ayi, ma unu emeghi ihe nile M'kwuru? 47 Onye ọ bula nke nābiakutem, nke nānu kwa okwum nile, nke nēme kwa ha, M'gēgosi unu onye o yiri: 48 o yiri madu nke nēwu ulo, onye gwuru gwumi kwa, we tọ ntọ-ala n'elu oké nkume: mb͕e miri juru, osimiri we tikwasi ulo ahu, ma o nweghi ike ime ya ka ọ me nkpatu: n'ihi na ewuru ya nke-ọma. 49 Ma onye nānu, ma o meghi ha, yiri madu nke nēwu ulo n'elu ala nēnweghi ntọ-ala; nke osimiri tikwasiri, ngwa ngwa o we dakasi; nbibi nke ulo ahu di kwa uku.

Luk 7

1 Mb͕e O kwubìri okwu-Ya nile na nti ndi-Ju, O we ba na Kapanaum. 2 Ma aru adighi orù otù ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise mma, onye di ya oké ọnu-ahia, ọ nọ n'ọnu ọnwu. 3 Mb͕e ọ nuru ihe bayere Jisus, o we zigara Ya ndi-okenye nke ndi-Ju, nārio Ya ka Ọ bia zọputa orù-ya. 4 Ma mb͕e ha biakutere Jisus, ha riọsie Ya ike, si, Ọ bu onye kwesiri ka I mere ya ihe a: 5 n'ihi na ọ nāhu mba-ayi n'anya, ya onwe-ya wukwara ulo-nzukọ-ayi nye ayi. 6 Jisus we so ha ga. Ma mb͕e Ọ nādighi n'ebe di anya n'ulo-ya ub͕u a, ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise we zigara Ya ufọdu ndi-enyì-ya, si Ya, Onye-nwe-ayi, esob͕ula Onwe-gi: n'ihi na erughm ka I ba n'okpuru ulom: 7 n'ihi nka agughm onwem onye kwesiri ibiakute Gi: kama were okwu-ọnu kwue, agēme kwa ka aru onye nējerem ozi di ike. 8 N'ihi na mu onwem bu kwa onye edoro n'okpuru ike, nēnwe ndi-agha n'okpuru mu onwem: m'we si onye a, Ga, ọ ga; m'si kwa onye ọzọ, Bia, ọ bia; m'si kwa orùm, Me nka, o me ya. 9 Ma mb͕e Jisus nuru ihe ndia, o juru Ya anya n'ihi ya, o we chigharia, si ìgwè madu nke nēso Ya, Asim unu, ọ dighi mb͕e M'huru oké okwukwe di otú a, ọbuná n'Israel. 10 Ndi ezitere we laghachi n'ulo-ya, hu ka aru di orù ahu nma. 11 O rue, mb͕e nwa oge gasiri, na Ọ garuru obodo anākpọ Nain; ndi nēso uzọ-Ya we so Ya ga, ha na oké ìgwè madu. 12 Ma mb͕e Ọ biaruru nso ọnu-uzọ-ama obodo ahu, le, anēbupu otù onye nwuru anwu, bú nwa-nwoke nke nne-ya muru nání ya, nwanyi ahu bu kwa onye di-ya nwuru: oké ìgwè nke ndi obodo ahu soro kwa ya. 13 Mb͕e Onye-nwe-ayi huru ya, O we nwe ọmiko n'aru ya, si ya, Akwala ákwá. 14 O we biaru nso, metu ib͕e ozu ahu aka: ndi nēbu ya we guzo. O we si, Nwa-okorọbia, gi ka M'nāsi, Bilie. 15 Onye ahu nke nwuru anwu we nọlie, malite ikwu okwu. O we were ya nye nne-ya. 16 Madu nile we tua egwu: ha we nye Chineke otuto, si, Onye-amuma uku ebiliwo n'etiti ayi: ha si kwa, Chineke eletawo ndi-Ya. 17 Okwu a bayere Ya we pua gazue na Judia dum, na ala nile di ya gburugburu. 18 Ndi nēso uzọ Jọn we kọrọ ya akukọ bayere ihe ndia nile. 19 Jọn we kpọ madu abua biakute ya nime ndi nēso uzọ-ya, zigara Onye-nwe-ayi, si, Gì onwe-gi bu Onye nābia, ma-ọbu na ayi nēle anya onye ọzọ? 20 Ma mb͕e ndikom ahu biakutere Ya, ha si, Jọn Baptist ezìwo ayi biakute Gi, si, Gì onwe-gi bu Onye nābia, ma-ọbu na ayi nēle anya onye ọzọ? 21 N'oge hour ahu O mere ka aru ọtutu madu di ike site n'ọria na ajọ ọria di iche iche na ndi ajọ mọ; O were kwa amara me ka ọtutu ndi-ìsì hu uzọ. 22 O we za, si ha, Ganu, kọrọ Jọn ihe nile unu huru na nke unu nuru; ndi-ìsì nāhu uzọ, ndi- ngwurọ nēje ije, anēme ndi-ekpenta ka ha di ọcha, ndi nti chiri nānu ihe, anēme ndi nwuru anwu ka ha si n'ọnwu bilie, anēzì ndi-ob͕eye ozi ọma. 23 Ngọzi nādikwara onye ahu, bú onye ọ bula nke nāgaghi-ama n'ọnyà n'arum. 24 Ma mb͕e ndi-ozi Jọn lasiri, Ọ malitere igwa ìgwè madu nile okwu bayere Jọn, si, Ọ̀ bu gini ka unu puru je n'ọhia ka unu kiri? àmì nke nēme nkpatu site n'ifufe? 25 Ma ọ̀ bu gini ka unu puru ka unu hu? nwòke eyikwasiworo uwe di biali-biali? Le, ndi nēyi ezi uwe kachasi mma, ndi bi kwa n'oké oriri na oké ọṅuṅu, nọ n'ulo ndi-eze. 26 Ma ọ̀ bu gini ka unu puru ka unu hu? ònye-amuma? E, asim unu, onye kari kwa onye-amuma nke-uku. 27 Nwoke a bu onye edeworo ihe n'akwukwọ nsọ bayere ya, si, Le, Mu onwem nēziga onye-ozim n'iru Gi, Onye gēmezi uzọ-Gi n'iru Gi. 28 Asim unu, N'etiti ndi ndinyom muru ọ dighi onye ka Jọn uku: ma onye dikariri ntà n'ala-eze Chineke ka ya uku. 29 Mb͕e ndi-Ju nile nuru Ya, ha na ndi-ọna-utu, ha we gua Chineke n'onye ezi omume, ebe ejiri baptism nke Jọn me ha baptism. 30 Ma ndi-Farisi na ndi-iwu juru n'onwe-ha ìzù Chineke, ebe ọ nēmeghi ha baptism. 31 Gini kwa ka M'gēji madu nke ọbọ a tuyere, gini kwa ka ha yiri? 32 Ha yiri umu-ntakiri ndi nānọdu n'ọma-ahia, nākpọ kwa ibe-ha òkù; ndi nāsi, Ayi b͕uru unu ọ̀jà, ma unu eteghi egwú; ayi kwara ákwá, ma unu etighi mkpu ákwá. 33 N'ihi na Jọn Baptist abiawo nērighi achicha nāṅughi kwa manya-vine; unu we si, O nwere mọ ọjọ. 34 Nwa nke madu abiawo nēri ihe-oriri nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu; unu we si, Le, onye-ori-nke-uku, na onye-oké-ọṅu-manya, enyì ndi-ọna-utu na ndi-nmehie! 35 Agukwara amam-ihe n'onye ezi omume site n'umu-ya nile. 36 Otù onye n'etiti ndi-Farisi we kpere Ya ka O so ya rie ihe. O we ba n'ulo onye-Farisi ahu, we nọdu na nri. 37 Ma le, otù nwanyi nke nọ n'obodo ahu, bú onye-nmehie; mb͕e ọ mara nke-ọma na Ọ nọduru na nri n'ulo onye-Farisi ahu, o we weta ite alabaster nke manu-otite di ya nime, 38 we guzo n'azu n'ukwu-Ya, nākwa ákwá, we malite iwere anya-miri-ya desa ukwu-Ya abua, o were kwa agiri-isi-ya hicha ha, o we sutu ukwu-Ya ọnu nke-uku, were manu-otite ahu te ha. 39 Ma mb͕e onye-Farisi nke kpọrọ Ya huru ya, o kwue n'onwe-ya, si, Nwoke a, asi na Ọ bu onye amuma, Ọ gāmara onye nwanyi a bu nke nēmetu Ya aka, na aha madu ọ bu, na ọ bu onye-nmehie. 40 Jisus we za, si Ya, Saimon, enwerem okwu M'gāgwa gi. O we si, Onye-ozizí, kwue. 41 Otù onye nke nēbinye madu ihe nwere madu abua ji ya ugwọ: otù onye ji ya nnù shilling na ọgu ise, ibe-ya ji kwa ya ọgu abua na iri. 42 Ebe ha nēnweghi ihe ha gēji kwughachi ya ugwọ, ọ were amara b͕aghara ha abua. Ònye kwa n'etiti ha abua gāhu kari ya n'anya? 43 Saimon we za, si, Ọ dim ka onye o were amara b͕aghara kari. O we si ya, I kpeziri. 44 Mb͕e O chigharisiri n'ebe nwanyi ahu nọ, Ọ si Saimon, Ì huru nwanyi a? Abataram n'ulo-gi, i nyeghi m miri iji sa ukwu: ma nwanyi a were anya-miri-ya desa ukwum, were kwa agiri-isi-ya hicha ha. 45 I sutughm ọnu: ma nwanyi a, site na mb͕e M'batara, ọ rapughi isutu ukwum ọnu nke-uku. 46 I weghi manu tem n'isi: ma nwanyi a were manu-otite tem n'ukwu. 47 N'ihi nka asim i, Ab͕agharaworo ya nmehie-ya, nke di ọtutu; n'ihi na ọ hurum n'anya nke-uku: ma onye ab͕aghara ihe ntà, onye ahu nāhu n'anya nke-ntà. 48 O we si nwayi ahu, Ab͕agharaworo gi nmehie nile gi. 49 Ndi ha na Ya nọduru na nri we malite isirita onwe-ha, Ònye bu Onye a, Nke nāb͕aghara kwa nmehie? 50 O we si nwanyi ahu, Okwukwe-gi azọputawo gi; la n'udo.

Luk 8

1 O we rue mb͕e nwa oge gasiri, na Ya onwe-ya nāgaghari n'obodo na obodo ntà di iche iche, nēkwusa nēzikwa ozi ọma ala-eze Chineke, Ya na ndi-ozi iri na abua ahu, 2 na ndinyom ufọdu ndi emereri ka aru-ha di ike site n'ichupu ndi-mọ ọjọ na igwọ nriaria, Meri nke akpọrọ Magdalini, onye mọ ọjọ asa siwori nime ya puta, 3 na Joana nwunye Kuza onye Herod tiyere ihe-ya n'aka, na Susana, na ọtutu ndi ọzọ, ndi nēweputa ihe ha nwere ime ezi ha. 4 Ma mb͕e oké ìgwè madu nēzukọ, mb͕e ndi si n'obodo nile nābiakute kwa Ya, O we kwue okwu site n'ilu: 5 Ọgha-nkpuru puru ka ọ gha nkpuru-ya: mb͕e ọ nāgha, ufọdu we da n'akuku uzọ; ewe zọkwasi ha ukwu, anu-ufe nke elu-igwe we tuturie ha. 6 Nkpuru ọzọ we da n'elu oké nkume; mb͕e ha puru ome, ha we kpọnwua, n'ihi na ha enweghi ala miri. 7 Nkpuru ọzọ we da n'etiti ogwu; ogwu ahu we so ha pue, kpab͕ue ha. 8 Nkpuru ọzọ we da n'ezi ala, ha we pue, we mia nkpuru ọgu ise ọgu ise. Mb͕e O nēkwu okwu ndia, O tie nkpu, si, Onye nwere nti inu ihe, ya nu. 9 Ndi nēso uzọ-Ya we jua Ya ihe ilu a gābu. 10 O we si, Ọ bu unu ka enyeworo imara ihe-omimi ala-eze Chineke: ma ndi fọduru ka anāgwa okwu n'ilu; ka ha ghara ihu n'ọhuhu, ghara kwa inuta n'ọnunu. 11 Ma ilu ahu bu nka: Nkpuru ahu bu okwu Chineke. 12 Ndi nọ n'akuku uzọ ahu bu ndi nuru; mb͕e ahu ekwensu bia, we napu okwu ahu n'obi-ha, ka ha ghara ikwere, ewe zọputa ha. 13 Ndi nọ kwa n'oké nkume ahu bu ndi were ọṅù nara okwu ahu mb͕e ọ bula ha nuru ya; ma ndia enweghi nkpọrọgwu, ndi kwere na nwa oge, ma n'oge ọnwunwa ha wezuga onwe-ha. 14 Nkpuru nke dara n'etiti ogwu ahu, ndia bu ndi nuru, ma mb͕e ha nāga n'uzọ-ha ncheb͕u na àkù na ihe-utọ nke ndu anākpab͕u ha, ha amighi ezi nkpuru. 15 Nkpuru nke di n'ala ọma ahu, ndia bu ndi were ezi obi di nma jisie okwu ahu ike, mb͕e ha nuru ya, ha were kwa ntachi-obi mia nkpuru. 16 Ma ọ dighi onye ọ bula, mb͕e ọ muyere oriọna, nēkpuchi ya n'ihe, ma-ọbu dọba ya n'okpuru ihe-ndina; kama ọ nādọba ya n'elu ihe-idọba-oriọna, ka ndi nke nābà nime we hu ìhè-ya. 17 N'ihi na ọ dighi ihe ezoro ezo, nke anāgaghi-eme ka ọ puta ìhè; ọ dighi kwa ihe di nzuzo, nke anāgaghi-ama, me kwa ka ọ puta ìhè. 18 Ya mere, lezienu anya otú unu si anu: n'ihi na onye ọ bula nke nwere, onye ahu ka agēnye; onye ọ bula nēnweghi kwa, ọbuná ihe ọ nēchè na o nwere ka agānapu ya. 19 Ma nne-Ya na umu-nne-Ya biakutere Ya, ma ha apughi ibiaru Ya nso n'ihi ìgwè madu ahu. 20 Ewe si Ya, Nne-gi na umu-nne-gi nēguzo n'èzí, nāchọ ihu Gi anya. 21 Ma Ọ zara, si ha, Nnem na umu-nnem bu ndia ndi nānu okwu Chineke, nēme kwa ya. 22 O rue n'otù nime ubọchi ahu, na Ọ batara n'ub͕ọ, Ya onwe-ya na ndi nēso uzọ-Ya; O we si ha, Ka ayi gabiga n'ofè ọdọ-miri a ọzọ: ha we nupu. 23 Ma mb͕e ha nēje Ọ da n'ura: oké ajọ ifufe we da n'ọdọ-miri ahu; miri nēju kwa n'ub͕ọ-ha, ha we nọdu n'ọnu ọnwu. 24 Ha we biakute Ya, kpọte Ya, si, Nna-ayi, Nna-ayi, ayi nāla n'iyì. O we teta, bara ifufe na ebili-miri mba: ha we da juu, ndaju we di. 25 O we si ha, Òle ebe ka okwukwe-unu di? Ha we tua egwu, o ju ha anya, ha sirita onwe-ha, Ònye bu kwa Onye a, na Ọ nēnye ọbuná ifufe na miri iwu, ha nāṅa kwa Ya nti? 26 Ha we rue ala ndi Gerasa, nke di na ncherita-iru Galili. 27 Ma mb͕e O siri n'ub͕ọ puta rigo n'ala, otù nwoke nke si n'obodo ahu puta zutere ya, bú onye nwere ndi-mọ ọjọ; ma na mb͕e di anya ọ dighi uwe o yiri, o bighi kwa n'ulo, kama n'ebe anēlì ozu. 28 Ma mb͕e ọ huru Jisus, o tisie nkpu ike, da kwa n'ala n'iru Ya, were oké olu si, Gini ka mu na Gi nwekọrọ, Jisus, Ọkpara Chineke Nke kachasi ihe nile elu? ariọm Gi, emekpalam aru. 29 N'ihi na O nyere mọ ahu nādighi ọcha iwu ka o si nime nwoke ahu puta. N'ihi na ọtutu mb͕e ka ọ nējisi ya ike: anēche kwa ya nche, ewere kwa nkpọrọ na nkpọrọ-ukwu ke ya; o we nyajipu ihe eji ke ya, mọ ọjọ ahu we churu ya ba n'ọhia. 30 Jisus we jua ya, si, Òle aha-gi? Ọ si, Legion; n'ihi na ọtutu ndi-mọ ọjọ bàra nime ya. 31 Ha we riọ Ya ka ọ ghara inye ha iwu ka ha je ba n'abyss. 32 Ma ìgwè ọtutu ezì di n'ebe ahu nāta nri n'ugwu: ha we riọ Ya ka O kwere ha ka ha ba nime ha. O we kwere ha. 33 Ndi-mọ ọjọ ahu we si nime nwoke ahu puta, ba nime ìgwè ezì ahu: ìgwè ezi ahu we nuda n'ebe ahu di nkputankpu dabà n'ọdọ-miri, miri we b͕ab͕ue ha. 34 Ma mb͕e ndi nāzù ha huru ihe emereri, ha b͕alaga, kọsa ya n'obodo ahu na gburugburu ya nile. 35 Ha we pua ihu ihe emereri; ha we biakute Jisus, we hu nwoke ahu, nke ndi-mọ ọjọ siri nime ya puta, ka ọ nọduru ala n'ukwu Jisus, yiri uwe, uche-ya zu-kwa-ra okè: ha we tua egwu. 36 Ndi huru ya we kọrọ ha otú azọputara onye ahu ndi-mọ ọjọ ji. 37 Ọra nile nke ala ndi Gerasa di ya gburugburu we kpere Ya ka O si n'ebe ha nọ la; n'ihi na ha nātu oké egwu: O we ba nime ub͕ọ, laghachi. 38 Ma nwoke nke ndi-mọ ọjọ siri nime ya puta nāriọ Ya ka ya na Ya biri: ma O zilagara ya, si, 39 Laghachi n'ulo-gi, kọrọ ha ihe nile, ka ha ra, bú nke Chineke meworo gi. O we je, nēkwusa n'obodo ahu dum ihe Jisus mere ya, ka ha ra. 40 Ma mb͕e Jisus laghachiri, ìgwè madu ahu nara Ya nke-ọma; n'ihi na ha nile nēle anya Ya. 41 Ma le, otù nwoke, aha-ya bu Jeairọs, biara, ya onwe-ya bu kwa onye-isi ulo-nzukọ: o we da n'ala n'ukwu Jisus, we riọ Ya ka Ọ bia n'ulo-ya; 42 n'ihi na o nwere nwa-nwanyi ọ muru nání ya, nke b͕ara ihe ra ka arọ iri na abua, nwata ahu nānwu kwa anwu. Ma mb͕e Ọ nēje ìgwè madu nile nākpab͕u Ya. 43 Otù nwanyi nke nwere orùrù-ọbara arọ iri na abua, nke mefusiri ihe dum o ji biri n'aru ndi-dibia, ma ọ dighi onye ọ bula nwere ike ime ka aru-ya di ike, 44 nwanyi ahu we bia n'azu Ya, we metu ọnu-ọnu uwe-Ya aka: ngwa ngwa orùrù-ọbara-ya we guzo. 45 Jisus we si, Ònye bu onye ahu nke meturum aka? Ma mb͕e madu nile di nāgo, Pita na ndi ya na ha yikọ si, Nna-ayi, ìgwè madu ndia nādagide Gi nākpab͕u kwa Gi. 46 Ma Jisus siri, Madu meturum aka: n'ihi na Mu onwem mara na ike esiwori n'arum puta. 47 Ma mb͕e nwanyi ahu huru na o zoghi ezo, o were ima-aru-jijiji bia, we da n'iru Ya, kọ n'iru ndi-Ju ahu nile ihe mere o ji metu Ya aka, na otú esi me ka aru di ya ike ngwa ngwa. 48 Ma Ọ siri ya, Nwam nwanyi, okwukwe-gi azọputawo gi; la n'udo. 49 Mb͕e Ọ kpu okwu n'ọnu, otù onye si n'ulo onye-isi ulo-nzukọ ahu bia, si, Nwa-gi nwayi anwuruwo; esob͕u-kwa-la Onye-ozizí a ọzọ. 50 Ma mb͕e Jisus nuru ya, Ọ za ya, si, Atula egwu: kwere nání, agāzọputa kwa ya. 51 Ma mb͕e Ọ biaruru ulo ahu, O kweghi onye ọ bula so Ya ba, ma-ọbughi Pita, na Jọn, na Jemes, na nna nwata-nwayi ahu na nne-ya. 52 Ma madu nile nākwa ákwá, nēti kwa aka n'obi n'ihi ya: ma Ọ siri, Unu akwala ákwá; n'ihi na ọ nwughi anwu, kama ọ nāraru ura. 53 Ha we chìa Ya ọchì, ebe ha matara na ọ nwuru anwu. 54 Ma Ya onwe-ya jidere ya n'aka, we kpọ, si, Nwata-nwanyi, bilie. 55 Mọ-ya we lata, o wè bilie ngwa ngwa: O we si ka enye ya ihe-oriri. 56 Ibobo we nwubiga ndi muru ya ókè n'aru: ma O nyere ha iwu ka ha ghara igwa onye ọ bula ihe emereri.

Luk 9

1 O we kpọkọta ndi-ozi iri na abua ahu, nye ha ike na ichi-isi n'ebe ndi-mọ ọjọ nile nọ, na igwọ ọria di iche iche. 2 O we zipu ha ikwusa ala-eze Chineke, na ime ka aru di ndi-nriaria ike. 3 O we si ha, Unu ewela ihe ọ bula n'ije-unu, unu ewela nkpa-n'aka, ma-ọbu àkpà, ma-ọbu ob͕e achicha, ma-ọbu ego; unu enwe-kwa-la uwe-ime abua. 4 Ulo ọ bula unu gābà, nọgidenu n'ebe ahu, si kwa n'ebe ahu pua. 5 Ka ha ra kwa, bú ndi nānaraghi unu nke-ọma, mb͕e unu nāpu n'obodo ahu tichapu ájá di n'ukwu-unu ka ọ buru ha àmà. 6 Ha we pua, we nējezu obodo ntà ahu nile, nēzisa ozi ọma Ya, nēme kwa ka aru madu di ike n'ebe nile. 7 Ma Herod, bú tetrarch, nuru ihe nile emere: o we nēcheb͕u onwe-ya, n'ihi na ufọdu siri, na Jọn esiwori na ndi nwuru anwu bilie; 8 ufọdu si-kwa-ra, na Elaija aputawori ihè; ndi ọzọ si-kwa-ra na otù onye nime ndi-amuma ochie esiwori n'ọnwu bilie ọzọ. 9 Ma Herod siri, Mu onwem bipuru isi Jọn: ma ònye bu Onye a, Nke m'nānu ihe bayere Ya di otú a? O we nāchọ uzọ ihu Ya anya. 10 Mb͕e ndi-ozi Jisus latara, ha we kọrọ Ya ihe nile ha mere, ka ha ra. O we chiri ha tiyere Onwe-ya, wezuga Onwe-ya iche rue obodo anākpọ Betsaida. 11 Ma mb͕e ìgwè madu nile mara ya, ha soro Ya: O we nara ha nke-ọma, we gwa ha okwu bayere ala-eze Chineke, nēme kwa ka aru di ha ike, bú ndi ọ di nkpà ka eme ka aru-ha di ike. 12 Ma chi malitere iji; ndi-ozi iri na abua ahu we biakute Ya, si Ya, Zilaga ìgwè madu a, ka ha we ga n'obodo ntà nile na ubi nile di buruburu, nọ ọnọdu-abali, chọta kwa ihe ha gēri; n'ihi na ayi nọ n'ebe a nime ọhia. 13 Ma Ọ siri ha, Unu onwe-unu nye ha ihe ka ha rie. Ha we si, Ayi enweghi kari ob͕e achicha ise na azù abua; ma-ọbughi na ayi onwe-ayi gāga zuta nri nye ndi nka nile. 14 N'ihi na ha ra ka nnù ndikom iri na nnù abua na ọgu iri. O we si ndi nēso uzọ-Ya, Menu ka ha nọdu ala n'òtù di iche iche, ihe dika ọgu madu abua na iri n'otù òtù. 15 Ha we me otú ahu, me ka ha nile nọdu ala. 16 O we nara ob͕e achicha ise na azù abua ahu, le anya n'elu-igwe, gọzie ha, nyawa; O we nēnye ndi nēso uzọ-Ya ka ha debe ha n'iru ìgwè madu ahu. 17 Ha we rie, afọ ju-kwa-ra ha nile: ewe tutukọ iberibe fọduru ha, nkata iri na abua. 18 O rue, mb͕e nání Ya nọ nēkpe ekpere, ndi nēso uzọ-Ya nọyere Ya: O we jua ha, si, Ònye ka ọra madu nāsi na Mu onwem bu? 19 Ha we za, si, Jọn Baptist; ma ndi ọzọ si, Elaija: ma ndi ọzọ si, na otù onye nime ndi-amuma ochie esiwo n'ọnwu bilie ọzọ. 20 O we si ha, Ma ọ̀ bu onye ka unu onwe-unu si na Mu bu? Pita we za, si, Kraist nke Chineke. 21 Ma Ọ dọrọ ha aka na nti, nye kwa ha iwu ka ha ghara igwa onye ọ bula ihe a; 22 si, Nwa nke madu aghaghi ihu ọtutu ahuhu, ndi-okenye na ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ aghaghi kwa iju Ya, aghaghi ib͕u kwa Ya, na ime kwa ka O si n'ọnwu bilie n'ubọchi nke-atọ. 23 O we si ha nile, Ọ buru na onye ọ bula achọ ka o som n'azu, ya ju onwe-ya, buli kwa obe-ya kwa-ubọchi, nēsokwam. 24 N'ihi na onye ọ bula nke nāchọ izọpuita ndu-ya, ọ gētufu ya; ma onye ọ bula nke gētufu ndu-ya n'ihim, onye ahu gāzọputa ya. 25 N'ihi na ùrù gini ka ọ nābara madu, ma ọ buru na o rita uwa dum n'urù, o we tufue ma-ọbu anapu ya onwe-ya? 26 N'ihi na onye ọ bula ihere Mu onwem na okwum nile gēme, ihere onye ahu gēme Nwa nke madu, mb͕e Ọ gābia n'ebube nke aka Ya, na ebube nke Nna-Ya, na ebube nke ndi-mọ-ozi-Ya di nsọ. 27 Ma asim unu n'ezie, Ufọdu di n'etiti ndi guzoro n'ebe a, ndi nāgaghi-edetu ọnwu ire ma-ọli, rue mb͕e ha gāhu ala-eze Chineke. 28 O we rue mb͕e ubọchi asatọ gasiri mb͕e O kwusiri okwu ndia, na Ọ chiri Pita na Jọn na Jemes tiyere Onwe-ya, rigo n'ugwu ahu ikpe ekpere. 29 Mb͕e Ọ nēkpe ekpere, oyiyi iru-Ya we di iche, uwe-Ya we nācha ucha nēb͕u kwa dika àmùma. 30 Ma le, Ya na ndikom abua nēkwurita okwu, ndi bu Moses na Elaija; 31 ndi emere ka ahu ha anya n'ebube, ndi nēkwu kwa okwu bayere ọlila-Ya, nke Ọ gaje imezu na Jerusalem. 32 Ma ura jururi Pita na ndi ya na ha nọ n'anya: ma mb͕e ha tetara nke-ọma, ha hu ebube-Ya, na ndikom abua ahu Ya na ha guzoro. 33 O we rue, mb͕e ha si n'ebe Ọ nọ nēkewapu, Pita si Jisus, Nna-ayi, ọ di nma ka ayi nọ n'ebe a: ka ayi ma kwa ulo-ikwū atọ; ka otù diri Gi, ka otù di-kwa-ra Moses, ka otù di-kwa-ra Eliaja: n'ihi na ọ mataghi ihe ọ nēkwu. 34 Mb͕e ọ nēkwu okwu ndia, igwe-oji we bia, kpuchie ha: ha we tua egwu mb͕e ha nābà n'igwe-oji ahu. 35 Olu we si n'igwe-oji ahu puta, si, Onye a bu Ọkparam, Onye M'rọputara: nurunu okwu-Ya. 36 Mb͕e olu ahu putasiri, ahuru nání Jisus. Ndi ahu we kpuchie ọnu-ha, ha akọghi kwa akukọ ihe ọ bula ha hururi nye onye ọ bula na mb͕e ahu. 37 O rue, n'ubọchi so ya, mb͕e ha siri n'ugwu ahu rida, na oké ìgwè madu zutere Ya. 38 Ma le, otù nwoke si n'ìgwè madu ahu ti nkpu, si, Onye-ozizí, ariọm Gi ka I le nwam nwoke anya; n'ihi na ọ bu nwam m'muru nání ya: 39 le kwa, ajọ mọ nējide ya, o we nēti nkpu na mberede; ajọ mọ ahu nēse kwa ya, me ka ọ nāsu ufufu n'ọnu, o ji kwa ike arapu ya, nēchihia ya aru nke-uku. 40 M'we riọ ndi nēso uzọ-Gi ka ha chupu ya; ma ha apughi. 41 Jisus we za, si, Unu ọb͕ọ nēnweghi okwukwe, nke nwe-kwa-ra anya-ùhìe, rùe ole mb͕e ka Mu na unu gānọ, ewem nagide kwa unu? kuta nwa-gi n'ebe a. 42 Mb͕e ọ nọ nābiakute Ya, mọ ọjọ ahu we tuda ya n'ala, sesie ya ike. Ma Jisus bara mọ ahu nādighi ọcha nba, we me ka aru nwa-okoro ahu di ike, O we kuru ya nyeghachi nna-ya. 43 Ma ibobo idi-uku nke Chineke nwuru ha nile n'aru. Ma mb͕e ihe nile Ọ nēme nēju madu nile anya, Ọ si ndi nēso uzọ-Ya, 44 Unu onwe-unu debe okwu ndia na nti-unu: n'ihi na agaje irara Nwa nke madu nye n'aka madu. 45 Ma ha aghọtaghi okwu a, ọ bu kwa ihe ezonariwori ha, ka ha ghara inuta ya: ha nātu kwa egwu iju Ya ajuju bayere okwu a. 46 Iru-uka we da n'etiti ha, onye gāka ibe-ya uku n'etiti ha. 47 Ma mb͕e Jisus huru iru-uka nke di n'obi-ha, O jide nwatakiri n'aka, debe ya n'akuku Ya, 48 we si ha, Onye ọ bula nke gānara nwatakiri a nke-ọma n'aham, ọ bu Mu onwem ka ọ nānara nke-ọma: onye ọ bula nke nānara kwa Mu nke-ọma nānara Onye ziputaram nke-ọma: n'ihi na onye dikari ntà n'etiti unu nile, onye ahu bu onye uku. 49 Jọn we za, si, Nna-ayi, ayi huru otù onye ka ọ nāchupu ndi-mọ ọjọ n'aha-Gi; ayi we b͕ochie ya, n'ihi na ọ dighi-eso ayi. 50 Ma Jisus siri ya, Unu eb͕ochila ya: n'ihi na onye nādighi-emegide unu diri unu. 51 O rue, mb͕e ubọchi nēzu okè mb͕e agānara Ya n'elu, na Ya onwe-ya che iru-Ya si-ike iga Jerusalem, 52 O we zipu ndi-ozi n'iru Ya: ha we ga, ba n'otù obodo ntà nke ndi Sameria, ka ha doziere Ya. 53 Ma ha anaraghi Ya nke-ọma, n'ihi na iru-Ya di ka Ọ nāga Jerusalem. 54 Ma mb͕e ndi nēso uzọ-Ya, bú Jemes na Jọn, huru nka, ha si, Onye-nwe-ayi, Ì nāchọ ka ayi si ọku site n'elu-igwe da, rechapu ha? 55 O we chigharia, bara ha nba, si, Unu amataghi aha mọ di nime unu. 56 N'ihi na Nwa nke madu abiaghi ila ndu madu n'iyì, kama ka o we zọputa ha. Ha we pua ga n'obodo ntà ọzọ. 57 Mb͕e ha nāga n'uzọ, otù onye we si Ya, M'gēso Gi ebe ọ bula Ì nēje. 58 Jisus we si ya, Nkita-ọhia nwere ọnu ha nēdina, anu-ufe nke elu-igwe nwe-kwa-ra ebe ha nāraru ura; ma Nwa nke madu enweghi ebe itọb͕ọ isi-Ya. 59 O we si onye ọzọ, Som. Ma ọ siri, Onye-nwe-ayi, kwe ka m'buru uzọ je lìe nnam. 60 Ma Ọ siri ya, Rapu ndi nwuru anwu ka ha lìe ndi nke ha ndi nwuru anwu; ma gi onwe-gi je zisa ozi ala-eze Chineke. 61 Onye ọzọ we si kwa, M'gēso Gi, Onye-nwe-ayi; ma kwe ka m'buru uzọ kele ndi nọ n'ulom ekele ikpe-azu. 62 Ma Jisus siri ya, Ọ dighi onye ọ bula nke nēle anya n'azu, mb͕e o tiyesiri aka-ya n'ọ́gù anu-ulo nādọkpughari, kwesiri ala-eze Chineke.

Luk 10

1 Ma mb͕e ihe ndia gasiri Onye-nwe-ayi guputara ọgu ndikom atọ na iri di iche, we zipu ha abua abua ka ha ga n'iru Ya ba n'obodo na ebe ọ bula, ebe Ya onwe-ya gaje ibia. 2 O we si ha, Owuwe-ihe-ubi riri nne n'ezie, ma ndi-ọlu di ole-na-ole: ya mere, nāriọnu Onye-nwe owuwe-ihe-ubi ahu, ka O zipu ndi-ọlu ba n'owuwe-ihe-ubi-Ya. 3 Jenu: le, Mu onwem nēzipu unu dika umu-aturu n'etiti agu. 4 Unu ewela àkpà-ego, ma-ọbu àkpà-ije, ma-ọbu akpukpọ-ukwu: unu ekele-kwa-la onye ọ bula n'uzọ. 5 Ma ulo ọ bula unu gābà nime ya, burunu uzọ si, Udo diri ulo a. 6 Ọ buru kwa na onye-udo nọ n'ebe ahu, udo-unu gānọkwasi ya: ma ọ buru na onye-udo anọghi ya, udo-unu gālaghachiri unu ọzọ. 7 Nọgide-kwa-nu n'ulo ahu, nēri nāṅu kwa ihe ha nēnye umu: n'ihi na onye-ọlu kwesiri ugwọ-ọlu-ya. Unu esila n'otù ulo ba n'ulo ọzọ. 8 Nime obodo ọ bula unu gābà kwa, ha we nara unu nke-ọma, rienu ihe edebere n'iru unu: 9 mekwanu ndi aru-ha nādighi ike nọ n'ebe ahu ka aru-ha di ike, si-kwa-nu ha, Ala-eze Chineke di unu nso. 10 Ma nime obodo ọ bula unu gābà, ma ha anaraghi unu nke-ọma, puanu n'amá-ya, si, 11 Ọbuná ájá si n'obodo-unu, nke rakuru n'ukwu-ayi, ka ayi nēhichapu imegide unu: otú ọ di, maranu nka, na ala-eze Chineke di nso. 12 Asim unu, Ala Sọdọm gānagide okwu n'ubọchi ahu kari obodo ahu. 13 Ahuhu gādiri gi, Korazin; ahuhu gādiri gi, Betsaida; n'ihi na asi na alururi ọlu nile di ike na Taia na Saidon, nke aluru nime unu, ha gēchèghariwori n'oge di anya gara aga, nānọdu n'ákwà-nkpe na ntu. 14 Otú ọ di, Taia na Saidon gānagide okwu n'ikpé ahu kari unu. 15 Gi onwe-gi kwa, Kapanaum, àgēweli gi rue elu-igwe? agēweda gi rue Hedis. 16 Onye nānu okwu-unu nānu okwu Mu onwem; onye nāju kwa unu nāju Mu onwem; ma onye nāju Mu onwem nāju Onye ziterem. 17 Ọgu ndikom atọ na iri ahu were ọṅù lata, si, Onye-nwe-ayi, ọbuná ndi-mọ ọjọ ka anēdo n'okpuru ayi n'aha-Gi. 18 O we si ha, Ahurum Setan ka ọ darari dika àmùmà pua n'elu-igwe. 19 Le, enyewom unu ike izọkwasi agwọ na akpi ukwu, na imegide ike onye-iro-unu nile: ọ dighi kwa ihe ọ bula gēmeru unu aru ma-ọli. 20 Otú ọ di, unu aṅurila ọṅu na nka, na anēdo ndi ajọ mọ n'okpuru unu; ma ṅurianu ọṅu na edewo aha-unu n'akwukwọ n'elu-igwe. 21 N'oge hour ahu tọrọ Ya utọ nke-uku nime Mọ Nsọ, O we si, Ekelem Gi, Nna, Onye-nwe elu-igwe na uwa, na I zonariri ndi-amam-ihe na ndi nwere nghọta ihe ndia, I were kwa ha kpughere umu ọhu: e, Nna; ekelem Gi na ọ di ezi nma otú a n'iru Gi. 22 Nnam rara ihe nile nyem n'aka: ọ dighi kwa onye ọ bula mara Onye Ọkpara ahu bu, ma-ọbughi Nna-Ya; na Onye Nna ahu bu, ma-ọbughi Ọkpara-Ya, na onye ọ bula Ọkpara nēzube ikpughe Ya nye ya. 23 Mb͕e O chigharisiri n'ebe ndi nēso uzọ-Ya nọ, O we si n'iche, Ngọzi nādiri anya nāhu ihe unu nāhu: 24 n'ihi na asim unu, na ọtutu ndi-amuma na ndi-eze chọrọ ihu ihe unu onwe-unu nāhu, ma ha ahughi ha; na inu ihe unu nānu, ma ha anughi ha. 25 Ma le, otù onye-iwu biliri, we nwa Ya, si, Onye-ozizí, ọ̀ bu gini ka m'gēme ka m'we keta ndu ebighi-ebi? 26 O we si ya, Gini ka edeworo n'akwukwọ iwu? ì si aṅa agu ya? 27 O we za, si, Hu Onye-nwe-ayi Chineke-gi n'anya site n'obi-gi dum, were kwa nkpuru-obi-gi dum, na ike-gi dum, na uche-gi dum; hu kwa onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi. 28 O we si ya, I zara nke-ọma: me nka, i gādi kwa ndu. 29 Ma ebe ọ nāchọ igu onwe-ya n'onye ezi omume, ọ si Jisus, Ònye bu kwa onye-ab͕ata-obim? 30 Jisus zara ya, si, Otù nwoke si na Jerusalem nārida iga Jeriko; o we dabà n'etiti ndi nāpunara madu ihe, ndi b͕ara ya ọtọ ti kwa ya ihe-otiti, we la, rapu ya ọtọgbọrọ. 31 Ma n'otù mb͕e ahu otù onye-nchu-àjà nārida n'uzọ ahu: mb͕e ọ huru ya, o we si n'akuku uzọ ọzọ gabiga. 32 Otú ahu onye Livai, mbe ọ biaruru ebe ahu, hu kwa ya, o we si kwa n'akuku uzọ ọzọ gabiga. 33 Ma otù onye Sameria, mb͕e ọ nọ n'ije, ọ bia rue n'ebe ọ nọ: mb͕e ọ huru ya, o we nwe ọmiko n'aru ya, 34 o we biakute ya, ke ọnyá nile ya, wukwasi ha manu na manya-vine; o we tukwasi ya n'anu-ulo nke aka ya, dubata ya n'ulo ndi-ọbìa, we le ya anya nke-ọma. 35 N'echi-ya o we tuputa shilling abua, nye onye-nwe ulo ndi-ọbìa ahu, si, Le ya anya nke-ọma; ihe ọ bula i n'akuku uzọ kari, mu onwem, mb͕e m'latara, m'gākwughachi gi. 36 Ọ̀ bu onye nime madu atọ a, ka i chère, gosiri onwe-ya ka onye-ab͕ata-obi nke onye ahu dabàra n'etiti ndi ahu nāpunara madu ihe? 37 Ọ si, Onye ahu nke mere ya ebere. Jisus we si ya, Ga, gi onwe-gi me kwa otú ahu. 38 Ma mb͕e ha nāga, Ya onwe-ya batara n'otù obodo ntà: otù nwanyi, aha-ya bu Mata, we kpọbata Ya n'ulo-ya. 39 O nwekwara nwa-nne-nwanyi anākpọ Meri, onye nānọdu kwa ala n'ukwu ala Onye-nwe-ayi, we nu okwu-Ya. 40 Ma uche Mata nābasasi n'ije-ozi nke-uku; o we biakute Ya ọsọsọ, si, Onye-nwe-ayi, ò metughi Gi n'obi na nwa-nnem nwanyi nārapum ka nání mu nēje ozi? ya mere, gwa ya ka o yerem aka. 41 Ma Onye-nwe-ayi zara, si ya, Mata, Mata, i nēcheb͕u onwe-gi nēsob͕u kwa onwe-gi n'ihi ọtutu ihe: 42 ma otu ihe bu ihe di nkpà: n'ihi na Meri rọputara ezi òkè ahu, nke anāgaghi-anapu ya.

Luk 11

1 O rue, mb͕e Ọ nēkpe ekpere n'otù ebe, mb͕e O kpebìri, na otù onye nime ndi nēso uzọ-Ya si Ya, Onye-nwe-ayi, zí ayi ikpe ekpere, dika Jọn zikwara ndi nēso uzọ-ya. 2 O we si ha, Mb͕e ọ bula unu nēkpe ekpere, sinu, Nna, Ka edo aha-Gi nsọ. Ka ala-eze-Gi bia. 3 Nēnye ayi nri kwa-ubọchi nke gēzuru ayi n'ubọchi ta. 4 B͕aghara kwa ayi nmehie nile ayi; n'ihi na ayi onwe-ayi nāb͕aghara kwa onye ọ bula nke ji ayi ugwọ. Ewebà-kwa-la ayi nime ọnwunwa. 5 O we si ha, Ònye nime unu gēnwe eyì, gējeku kwa ya n'etiti abali, si ya, Eyìm, binyem ob͕e achicha atọ; 6 n'ihi na otù eyìm esiwo n'ije biakutem, ma enweghm ihe ọ bula m'gēdebe n'iru ya; 7 ma onye ahu gēsi nime ulo za, si, Esob͕ulam: emechiwo uzọ ub͕u a, mu na umu-ntakirim nēdina kwa n'ihe-ndina-ayi; apughm ibili inye gi? 8 Asim unu, Ọ buru kwa na ọ gaghi-ebili inye ya n'ihi na ọ bu eyì-ya, ma n'ihi aririọ-ya nēnweghi ihere ọ gēbili nye ya ka ihe di ya nkpà ra. 9 Mu onwem si kwa unu, Riọnu, agēnye kwa unu, chọnu, unu gāchọta kwa; kuanu, agēmeghe-kwa-ra unu. 10 N'ihi na onye ọ bula nke nāriọ nāriọta; onye nāchọ kwa nāchọta; onye nāku kwa ka agēmeghere. 11 Ma ònye n'etiti unu, bú nna, ka nwa-ya gāriọ ob͕e achicha, ọ nye ya nkume? ma-ọbu azù, ọ nye ya agwọ n'ọnọdu azù? 12 Ma-ọbu asi na ọ gāriọ àkwá ọkuku, ọ̀ gēnye ya akpi? 13 Ya mere, ọ buru na unu onwe-unu, ọ bu ezie na unu jọrọ njọ, ma unu nāmata inye umu-unu ezi onyinye, Nnà-unu nke elu-igwe gēsi aṅa ghara iwere kari Mọ Nsọ nke-uku nye ndi nāriọ Ya? 14 Ọ nāchupu kwa mọ ọjọ nke dara ob͕i. O we rue, mb͕e mọ ọjọ ahu putasiri, na onye-ob͕i ahu kwuru okwu; O we ju ìgwè madu nile anya. 15 Ma ufọdu nime ha siri, N'ike Beelzebul onye-isi ndi-mọ ọjọ ka Ọ nāchupu ndi-mọ ọjọ. 16 Ndi ọzọ nāchọ ihe-iriba-ama n'aka-Ya site n'elu-igwe, n'ihi na ha nānwa Ya. 17 Ma ebe Ya onwe-ya matara èchìchè-uche nile ha, Ọ si ha, Ala-eze ọ̀ bula nke kewara megide onwe-ya, anēme ya ka ọ tọb͕ọrọ n'efu; ulo nke kewakwara megide ulo nāda. 18 Ma ọ buru kwa na Setan kewara megide onwe-ya, àla-eze-ya gēsi aṅa guzo? n'ihi na unu nāsi na anamachupu ndi-mọ ọjọ n'ike Beelzebul. 19 Ma ọ buru na Mu onwem achupu ndi-mọ ọjọ n'ike Beelzebul, n'ike onye ka umu-unu ndikom nāchupu ha? n'ihi nka ha gābu ndi-ikpé-unu. 20 Ma ọ buru na Mu onwem achupu ndi-mọ ọjọ n'ike nkpisi-aka Chineke, ya mere ala-eze Chineke ruru unu aru. 21 Mb͕e ọ bula onye di ike nke kezuru ihe-agha-ya nēche obí nke aka ya, ihe o nwere adi n'udo: 22 ma mb͕e ọ bula onye ka ya ike gābia imegide ya, meri kwa ya, ọ nara ya ihe-agha-ya dum nke ọ tukwasiriri obi-ya, keri kwa ihe ọ nara ya. 23 Onye nādighi n'akukum nēmegidem; onye nādighi-esokwam ikpokọta ihe nāchusa achusa. 24 Mb͕e ọ bula mọ nādighi ọcha siri n'aru madu pua, ọ nāgabiga n'ebe miri nādighi nāchọ izu-ike: ma ebe ọ dighi-achọta ya, ọ si, M'gālaghachi n'ulom ebe m'siri puta. 25 Mb͕e ọ biara, o we hu ya ka azachasiri ya dozisia ya. 26 Mb͕e ahu ọ ga, chiri mọ-ibe-ya asa nke jọkari ya onwe-ya njọ tiyere onwe-ya; ha we ba biri n'ebe ahu: ọnọdu ikpe-azu nke madu ahu bia jọkari nke-mbu. 27 O we rue, mb͕e Ọ nēkwu okwu ndia, na otù nwanyi si n'etiti ìgwè madu ahu weli olu-ya, si Ya, Ngọzi nādiri afọ nke buru Gi, na ara nke I miri. 28 Ma Ya onwe-ya siri, Nke bu ezi-okwu kari bu, ngọzi nādiri ndi nuru okwu Chineke, debe kwa ya. 29 Ma mb͕e ìgwè madu nēzukọ n'ebe Ọ nọ, Ọ malitere isi, Ọb͕ọ a bu ajọ ọb͕ọ: ọ nāchọ ihe-iriba-ama; agaghi-enye kwa ya ihe-iriba-ama ma-ọbughi ihe-iriba-ama nke Jona. 30 N'ihi na dika Jona ghọrọ ndi Nineve ihe-iriba-ama, otú a ka Nwa nke madu gādi-kwa-ra ọb͕ọ a. 31 Agēme ka eze-nwanyi nke Ndida so ndikom nke ọb͕ọ a bilie n'ikpé ahu, ọ gāma kwa ha ikpé: n'ihi na o siri n'ebe uwa sọturu bia inu amam-ihe Solomom; ma le, Onye ka Solomom nọ n'ebe a. 32 Ndikom Nineve gēso ọb͕ọ a bilie n'ikpé ahu, ha gāma kwa ya ikpé: n'ihi na ha chèghariri na nkwusa nke Jona; ma le, Onye ka Jona nọ n'ebe a. 33 Ọ dighi onye ọ bula, mb͕e ọ muyere oriọna, nādọba ya n'ebe di nzuzo, ma-ọbu n'okpuru mb͕é, kama n'elu ihe-idọba-oriọna, ka ndi nābà nime ulo we hu ìhè-ya. 34 Oriọna nke aru-gi bu anya-gi: mb͕e ọ bula anya-gi nēle otù ebe, aru-gi dum juputa-kwa-ra n'ìhè; ma mb͕e ọ bula ọ jọrọ njọ, aru-gi juputa-kwa-ra n'ọchichiri. 35 Ya mere, le anya ma ihè di nime gi abughi ọchichiri. 36 Ya mere, ọ buru na aru-gi dum ejuputa n'ìhè, ghara inwe akuku ọ bula b͕ara ọchichiri, aru ahu dum gējuputa n'ìhè, dika mb͕e oriọna, site n'ìhè-ya nēnwu, nēnye gi ìhè. 37 Ma mb͕e Ọ nēkwu okwu, onye-Farisi kpọrọ Ya ka O so ya rie nri-ututu: O we ba, nọdu na nri. 38 Ma mb͕e onye-Farisi ahu huru ihe Ọ nēme, o ju ya anya na O bughi uzọ kwo aka-Ya mb͕e Ọ gaje iri nri-ututu. 39 Ma Onye-nwe-ayi siri ya, Ub͕u a ka unu onwe-unu, bú ndi-Farisi, nēme ka azú iko na afere di ọcha; ma ime-unu juputara n'ipunara-madu-ihe na ajọ ihe. 40 Unu ndi nēnweghi uche, Onye ahu Nke mere azú iko, ọ̀ bughi Ya me-kwa-ra ime-ya? 41 Otú ọ di, werenu ihe di nime lua ọlu ebere; ihe nile di kwa ọcha n'ebe unu nọ. 42 Ma ahuhu gādiri unu ndi-Farisi; n'ihi na unu nēnye otù uzọ n'uzọ iri nke nkpa-akwukwọ nēsi ísì utọ na rue na nkpa-akwukwọ nile, ma unu nagabiga ikpé na ihu-n'anya Chineke: ma ọ di nkpà ka unu me ihe ndia, ka unu ghara kwa irapu ihe ahu. 43 Ahuhu gādiri unu ndi-Farisi; n'ihi na unu nāhu isi oche nile n'ulo-nzukọ nile, na ekele n'ọma-ahia nile, n'anya. 44 Ahuhu gādiri unu; n'ihi na unu di ka ílì nke nāputaghi ìhè, nke madu ndi nējeghari n'elu ha nāmataghi ya. 45 Ma otù onye nime ndi-iwu zara, si Ya, Onye-ozizí, n'ikwu okwu a I nēme kwa ayi ihe-ihere. 46 O we si, Ahuhu gādi-kwa-ra unu ndi-iwu; n'ihi na unu nēbo madu ibu di ike obubu, ma unu onwe-unu ejighi otù nime nkpisi-aka-unu kpatu ibu ahu. 47 Ahuhu gādiri unu; n'ihi na unu nēwu ebe anēlì ndi-amuma, ma nna-unu-hà b͕uru ha. 48 Ya mere unu bu ndi-àmà, ọlu nna-unu-hà di kwa unu ezi nma: n'ihi na ha onwe-ha b͕uru ha, ma unu onwe-unu nēwu ebe anēlì ha. 49 N'ihi nka amam-ihe Chineke kwu-kwa-ra, si, M'gēzigara ha ndi-amuma na ndi-ozi; ufọdu nime ha ka ha gēb͕u kwa sob͕u kwa; 50 ka ewe chọputa ọbara ndi-amuma nile, nke awusiworo site na ntọ-ala uwa, n'aka ọb͕ọ a; 51 site n'ọbara Ebel rue ọbara Zakaraia, onye lara n'iyì n'ab͕ata ebe-ichu-àjà na ulo nsọ unu: e, asim unu, agāchọputa ya n'aka ọb͕ọ a. 52 Ahuhu gādiri unu ndi-iwu; n'ihi na unu wepuru nkpisi-ugodi nke ọmuma-ihe: unu onwe-unu abataghi, unu b͕ochi-kwa-ra ndi nābata. 53 Mb͕e O siri n'ebe ahu puta, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi we malite inọgide Ya si-ike, na ikpasu Ya ikwu okwu bayere ọtutu ihe; 54 nēche Yá anwu, inwude ihe nke gēsi n'ọnu-Ya puta.

Luk 12

1 N'oge ahu, mb͕e oké ọtutu ìgwè madu anādighi-aguta aguta zukọrọ, nke mere ka ha nāzọkwasi ibe-ha ukwu, O buru uzọ malite isi ndi nēso uzọ-Ya, Nēzenu ihe ndi-Farisi, bú ihe nēko achicha, nke bu iru-abua. 2 Ma ọ dighi ihe ọ bula ekpuchiworo ekpuchi, nke anāgaghi-ekpughe: ọ dighi kwa ihe ezoro ezo, nke anāgaghi-ama. 3 Ya mere ihe ọ bula unu kwuru n'ọchichiri, agānu ya n'ìhè; ihe unu kwu kwa-ra na nti n'ime-ulo ntà, agēkwusa ya n'elu ulo. 4 Ma asim unu ndi-eyim, Unu atula egwu ndi nēb͕u aru, ma emesia ha enweghi ihe ọzọ kari nke ahu ha gēme. 5 Ma M'gēgosi unu Onye unu gātu egwu: tuanu egwu Onye ahu, Nke nwere ike itubà n'ọku ala-mọ mb͕e O b͕usiri; e, asim unu, Tuanu egwu Onye ahu. 6 Àdighi-ere egwele ise na penny abua? ma adighi-echezọ otù nime ha n'iru Chineke. 7 Ma ọbuná agiri-isi nile nke isi-unu ka aguworo. Unu atula egwu: ọnu-ahia-unu kariri nke ọtutu egwele. 8 Ma asim unu, Onye ọ bula nke gēkwuputam n'iru madu, ya ka Nwa nke madu gēkwuputa kwa n'iru ndi-mọ-ozi nke Chineke: 9 ma onye gāgọnarim n'iru madu, agāgọnari ya n'iru ndi-mọ-ozi nke Chineke. 10 Ọzọ, onye ọ bula nke gēkwu okwu megide Nwa nke madu, agāb͕aghara ya: ma agaghi-ab͕aghara onye gēkwulu Mọ Nsọ. 11 Ma mb͕e ọ bula ha kpọrọ unu bia n'iru ulo-nzukọ, na ndi-isi, na ndi nāchi isi, unu echeb͕ula onwe-unu otú unu gāgọpu onwe-unu ma-ọbu ihe unu gēji gọpu onwe-unu, ma-ọbu ihe unu gēkwu: 12 n'ihi na Mọ Nsọ gēzí unu n'oge hour ahu ihe unu nāghaghi ikwu. 13 Ma otù onye sitere n'igwè madu ahu si Ya, Onye-ozizí, gwa nwa-nnem nwoke ka o kère ihe-nketa-ayi nyem. 14 Ma Ọ siri Ya, Nwoke, ònye merem ka M'buru onye-ikpé ma-ọbu onye-òkìkè n'ebe unu nọ? 15 O we si ha, Lezienu anya, debe-kwa-nu onwe-unu ka unu ghara inwe anya-uku ọ bula: n'ihi na ọ bughi n'ihe ọ nwebigara ókè ka ndu madu di, o sighi n'ihe o nwere puta. 16 O we turu ha ilu, si, Ala otù ọgaranya miri nkpuru ri nne: 17 o we tugharia n'obi-ya, si, Gini ka m'gēme, n'ihi na enweghm ebe ikpokọta nkpurum? 18 O we si, Nka ka m'gēme: m'gēweda ọbam, wu kwa nke ka uku; n'ebe ahu ka m'gēkpokọta ọkam nile na ezi ihem nile. 19 M'gāsi kwa nkpuru-obim, Nkpuru-obi, i nwere ọtutu ezi ihe edebere nye gi rue ọtutu arọ; nēzu ike, nēri ihe, nāṅu ihe-ọṅuṅu, ka obi nātọ gi utọ. 20 Ma Chineke siri ya, Onye nēnweghi uche, n'abali a ka anāchọ mkpure-obi-gi n'aka-gi; ma ihe i doziri, ònye gēnwe ha? 21 Otú a ka ọ di, bú onye nākpadoro onwe-ya àkù, ma ọ bughi ọgaranya n'ebe Chineke nọ. 22 Ọ we si ndi nēso uzọ-Ya, N'ihi nka ka M'ji si unu, Unu echeb͕ula onwe-unu nye ndu-unu, ihe unu gēri; echeb͕u-kwa-la onwe-unu nye aru-unu, ihe unu gēyi. 23 N'ihi na ndu kariri ihe eji azù ya, aru kari-kwa-ra uwe-oyiyi-ya. 24 Tugharinu uche n'ugolo-ọma, na ha adighi-agha nkpuru, ha adighi-ewe kwa ihe ubi; nke nēnweghi ime-ulo ntà ma-ọbu ọba; ma Chineke nāzù ha: ùnu onwe-unu abughi ihe oké ọnu-ahia kari anu-ufe nke-uku? 25 Ma ònye n'etiti unu puru itukwasi otù cubit n'ogologo-ya site n'icheb͕u onwe-ya? 26 Ya mere ọ buru na unu apughi ime ọbuná nke dikarisiri ntà, gini mere unu nēcheb͕u onwe-unu n'ihe fọduru? 27 Tugharinu uche n'ahihia nke ọhia, otú ha nētó etó: ha adọb͕ughi onwe-ha n'ọlu, ha atughi kwa ogho; ma asim unu, Ọbuná Solomom n'ebube-ya nile, eb͕okwasighi ya ákwà dika otù nime ndia. 28 Ma ọ buru na Chineke eyikwasi ahihia di n'ubi uwe otú a, nke di ta, echi atubà ya n'ite ọku; Ọ̀ gaghi-eyikwasi kari unu uwe nke-uku, unu ndi okwukwe ntà? 29 Unu onwe-unu achọ-kwa-la ihe unu gēri, na ihe unu gāṅu, unu enwe-kwa-la obi abua. 30 N'ihi na ihe ndia nile ka mba nile nke uwa nāchọ: ma Nna-unu nāmata na ihe ndia di unu nkpà. 31 Otú ọ di, chọnu ala-eze-Ya, agātukwasi-kwa-ra unu ihe ndia. 32 Atula egwu, ìgwè aturu ntà; n'ihi na ọ di Nna-unu ezi nma inye unu ala-eze-Ya. 33 Renu ihe unu nwere, were ha lua ọlu ebere; merenu onwe-unu àkpà-ego nke nādighi-aka nká, àkù nādighi-agwu agwu n'elu-igwe, ebe onye-ori nādighi-abia nso, ebe nla nādighi-emebi kwa ihe. 34 N'ihi na ebe àkù-unu di, n'ebe ahu ka obi-unu gādi kwa. 35 Ka eke unu ihe-ọkiké n'úkwù, ka oriọna-unu nēnwu kwa; 36 unu onwe-unu, yikwara ndi nēche onye-nwe-ha, mb͕e ọ gēsi n'oriri ọlulu-nwunye laghachi; ka, mb͕e ọ gābia ku aka n'ọnu-uzọ, ka ha we meghere ya ngwa ngwa. 37 Ngọzi nādiri ndi-orù ahu, ndi, mb͕e onye-nwe-ha gābia, ọ gāhu ka ha nēche nche: n'ezie asim unu, na ọ gēke onwe-ya ihe-ọkiké n'úkwù, me ka ha nọdu na nri, ọ gābia kwa jere ha ozi. 38 Ọ buru kwa na ọ gābia na nche nke-abua, ọ buru kwa na nke-atọ, hu kwa ha otú a, ngọzi nādiri ndi-orù ahu. 39 Ma unu mara nka, na ọ buru na nna-nwe-ulo matarari oge hour onye-ori gābia, ọ ganēche nche, ọ gaghi-arapu kwa ulo-ya ka egwupú ya. 40 Unu onwe-unu buru kwa ndi edoziworo: n'ihi na n'oge hour nke unu nēchèghi ka Nwa nke madu gābia. 41 Pita we si, Onye-nwe-ayi, Ọ̀ bu ayi ka I nāturu ilu a, ma-ọbu madu nile kwa? 42 Onye-nwe-ayi we si, Ònye kwa bu onye ahu nāchi èzí-na-ulo, onye kwesiri ka atukwasi ya obi, nke nwe-kwa-ra uche, nke onye-nwe-ya gēme onye-isi èzí-na-ulo-ya, inye ha òkè nri ha n'oge-ya? 43 Ngọzi nādiri orù ahu, onye, mb͕e onye-nwe-ya gābia, ọ gāhu ya ka ọ nēme otú a. 44 N'ezie asim unu, na ọ gēme ya onye-isi ihe nile o nwere. 45 Ma ọ buru na orù ahu gāsi n'obi-ya, Onye-nwem nānọ ọdù di anya ibia; ọ buru kwa na ọ gāmalite iti ndikom na ndinyom nēje ozi aka, na iri ihe-oriri na iṅu ihe-ọṅuṅu, na iṅubiga manya ókè; 46 onye-nwe orù ahu gābia n'ubọchi ọ nēleghi anya ya, na n'oge hour ọ nāmaghi, ọ gēb͕ubi kwa ya nkpirikpi abua, ke òkè nye ya n'etiti ndi nēkwesighi ka atukwasi ha obi. 47 Ọzọ, orù ahu, nke mara ihe onye-nwe-ya chọrọ, ma o dozighi, o meghi kwa dika ọ chọrọ, agāpia ya ọtutu utari; 48 ma onye nāmaghi, me kwa ihe kwesiri ihe-otiti, agāpia ya utari ole-na-ole. Ọzọ, onye ọ bula enyere ihe uku, n'aka-ya ka agāchọ kwa ihe uku: onye ha nye-kwa-ra ihe uku n'aka idebe, n'aka-ya ka ha gāju ihe nke ka. 49 Abiaram itusa ọku n'elu uwa; ma gini ka M'nāchọ, ọ buru na afunwuwo ya-ri ub͕u a? 50 Ma enwerem baptism agēji mem baptism; ọ nēb͕ukwam nb͕u n'obi nke-uku rue mb͕e agēmezu ya. 51 Ùnu nēchè na abiaram inye udo n'uwa? asim unu, É-è; kama nkewa: 52 n'ihi na site n'ub͕u a madu ise ndi kewaworo ekewa gādi n'otù ulo, madu atọ megide madu abua, madu abua megide kwa madu atọ. 53 Agēkewa ha, nna megide nwa-ya nwoke, nwa-nwoke megide kwa nna-ya; nne megide nwa-ya nwanyi, nwa-nwanyi megide kwa nne-ya; nne di megide nwunye nwa-ya, nwunye nwa megide kwa nne di-ya. 54 O we si kwa ìgwè madu nile, Mb͕e ọ bula unu huru igwe-oji ka o si n'Ọdida-anyanwu nārigo, ngwa ngwa unu nāsi, Nshansha-miri nābia; o were mee otua. 55 Mb͕e ọ bula unu hukwara ifufe Ndida ka ọ nēfe, unu nāsi, Ifufe di ọku gādi; o we me. 56 Ndi-iru-abua, unu matara itule iru ala na elu-igwe; ma òle ka o si di na unu amataghi itule oge a? 57 Ma gini mere unu adighi-ekpe n'onwe-unu ihe ziri ezi? 58 N'ihi na mb͕e gi na onye nēkuru gi ga ikpé nāga n'iru onye-isi, mesie ike ipu n'aka-ya n'uzo; ka ọ ghara idọkpuru gi nye onye-ikpé ma eleghi anya, onye-ikpé gārara kwa gi nye n'aka onye nēnye ndi-nmehie ahuhu, onye ahu nēnye ndi nmehie ahuhu gātubà kwa gi n'ulo-nkpọrọ 59 Asim i, I gaghi-aputa n'ebe ahu ma-ọli, rue mb͕e i gākwughachi ọbuná ego ntà ikpe-azu.

Luk 13

1 Ma ufọdu nọ n'ebe ahu n'oge ahu ndi kọrọ Ya akukọ bayere ndi Galili ahu, ndi Pailat were ọbara-ha gwakọta n'àjà-ha. 2 O we za, si ha, Ùnu nēchè na ndi Galili ndia bu ndi-nmehie kari ndi Galili nile, n'ihi na ha ahuwo ahuhu ndia? 3 Asim unu, É-è: kama, ọ buru na unu echègharighi, unu nile gāla n'iyì otú ahu. 4 Ma-ọbu madu iri na asatọ ahu, ndi ulo-elu di na Sailoam dakwasiri ha, we b͕ue ha, ùnu nēchè na ndi ahu bu ndi ji ugwọ kari madu nile ndi bi na Jerusalem? 5 Asim unu, É-è; kama, ọ buru na unu echègharighi, unu nile gāla n'iyì otú a. 6 O we tua ilu a; Otù onye nwere osisi fig akuru n'ubi-vine-ya; o we bia nāchọ nkpuru n'elu ya, ma ọ hughi. 7 O we si onye-ọlu-vine-ya, Le, site n'arọ atọ rue ub͕u a ka m'nābia nāchọ nkpuru n'osisi fig a, ma ahughm: b͕utue ya; gini mere ọ nēme kwa ka ala la n'iyì? 8 O we za, si ya, Onye-nwe-ayi, rapu kwa ya arọ a, rue mb͕e m'gēgwu ala-ya buruburu, wusa kwa ya ǹsí-anu: 9 ọ buru kwa na ọ mia nkpuru site n'ub͕u a, ọ di nma; ma ọ buru na ọ mighi, i gēb͕utu ya. 10 O we nēzí ihe n'otù nime ulo-nzukọ-ha n'ubọchi-izu-ike. 11 Ma le, otù nwanyi nke nwere mọ nke nēme ka aru-ya ghara idi ike arọ iri na asatọ; o rudakwara ala, ọ pughi kwa iweli onwe-ya elu ma-ọli. 12 Ma mb͕e Jisus huru nwanyi ahu, Ọ kpọ ya, si ya, Nwanyi, emewo gi ka i pua na nriaria-gi. 13 O we tukwasi nwanyi ahu aka-Ya abua: ngwa ngwa ewe me ka o guzozie ọtọ, o we nye Chineke otuto. 14 Ma onye-isi ulo-nzukọ ahu, ebe iwe were ya nke-uku n'ihi na Jisus mere ka aru madu di ike n'ubọchi-izu-ike, ọ zara, si ìgwè madu ahu, Ubọchi isi di nke madu aghaghi ilu ọlu nime ha: ya mere, bianu nime ha ka eme ka aru-unu di ike, unu abiakwala n'ubọchi-izu-ike. 15 Ma Onye-nwe-ayi zara ya, si, Ndi-iru-abua; onye ọ bula nime unu, ọ̀ dighi-atọpu ehi-ya ma-ọbu inyinya-ibu-ya n'ulo anu-ulo n'ubọchi-izu-ike, duru ya ga ime ka ọ ṅua miri? 16 Ma nwanyi a, ebe ọ bu nwa Abraham, onye Setan kere ab͕u, le, arọ iri na asatọ, ò kwesighi ka atọpu ya n'ab͕ú a n'ubọchi-izu-ike? 17 Mb͕e Ọ nēkwu ihe ndia, ewe me ka ihere me ndi nile nēmegide Ya: ìgwè madu ahu nile nāṅuri kwa ọṅu n'ihi ihe-ebube nile Ọ nēme. 18 Ya mere O kwuru, si, Gini ka ala-eze Chineke yiri? gini ka M'gēji kwa tunyere ya? 19 O yiri nkpuru mustard, nke madu were, tubà n'ubi nke aka ya ab͕ara ogige; o we ba uba, ghọ osisi; anu-ufe nke elu-igwe we nọ n'alaka-ya. 20 Ọzọ kwa Ọ siri, Gini ka M'gēji tuyere ala-eze Chineke? 21 O yiri ihe nēko achicha, nke nwanyi were, zobe na mb͕é utu ọka atọ, rue mb͕e utu ọka ahu dum kosiri. 22 O we nāga n'obodo na obodo ntà di iche iche, nēzí ihe, nāga kwa ije-Ya iru Jerusalem. 23 Otù onye we si Ya, Onye-nwe-ayi, Ǹdi anāzọputa di madu ole-na-ole? O we si ha, 24 Jisienu ike isi n'ọnu-uzọ di warara ba: n'ihi na ọtutu madu, ka M'si unu, gāchọ ibà nime ya, ma ha agaghi-enwe ike. 25 Mb͕e Nna-nwe-ulo gēbiliwori, mechi kwa uzọ-Ya, unu we malite iguzo n'èzí, na iku aka n'ọnu-uzọ ahu, si Onye-nwe-ayi, meghere ayi uzọ; ma Ọ gāza, si unu, Amataghim unu, ebe unu si bia; 26 mb͕e ahu ka unu gāmalite isi, Ayi riri ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu n'iru Gi, I zíkwara ihe n'amá-ayi; 27 ma Ọ gāsi, Asim unu, amataghm ebe unu si bia; puanu n'irum, ndi nile nālu ọlu ajọ omume. 28 N'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita ikekere-ezé ahu gādi, mb͕e unu gāhu Abraham, na Aisak, na Jekob, na ndi-amuma nile, n'ala-eze Chineke, ma unu onwe-unu aburu ndi achupuru n'èzí. 29 Ha gēsi kwa n'Ọwuwa-anyanwu na Ọdida-anyanwu, si kwa n'Ugwu na Ndida, bia, nọdu kwa n'ala-eze Chineke. 30 Ma le, ndi-ikpe-azu di ndi gēbu uzọ, ndi bu uzọ di kwa ndi gābu ndi-ikpe-azu. 31 N'oge hour ahu ndi-Farisi ufọdu biakutere Ya, si Ya, Pua, si n'ebe a la: n'ihi na Herod nāchọ ib͕u Gi. 32 O we si ha, Ganu, si nkita-ọhia ahu, Le, anamachupu ndi-mọ ọjọ, nāluzu kwa ọlu ime ka aru di madu ike ta na echi, n'ubọchi nke-atọ emekwam ka M'zu okè. 33 Otú ọ di, aghaghi m iga ta na echi na ubọchi so ya: n'ihi na apughi ikwe ka onye-amuma la n'iyì n'ebe nābughi Jerusalem. 34 Jerusalem, Jerusalem, nke nēb͕u ndi-amuma, nke nēwere kwa nkume atu ndi eziteworo ya! ọ̀tutu mb͕e ole ka M'chọrọ ichikọ umu-gi, ọbuná dika nnekwu-ọkuku nāchikọ umu nke aka ya n'okpuru nkù-ya abua, ma unu achọghi! 35 Le, anārapuru unu ulo-unu: ma asim unu, Unu agaghi-ahum ma-ọli, rue mb͕e unu gāsi, Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n'aha Onye-nwe-ayi.

Luk 14

1 O rue, mb͕e Ọ batara n'ulo otù onye nime ndi-isi nke ndi-Farisi iri nri n'ubọchi-izu-ike, na ndi ahu nēche Ya nche. 2 Ma le, otù nwoke nọ n'iru Ya nke nwere ọria aru-miri. 3 Jisus we za, gwa ndi-iwu na ndi-Farisi okwu, si, Ò ziri ezi n'iwu ime ka aru madu di ike n'ubọchi-izu-ike, ma-ọbu na o zighi ezi? 4 Ma ha kpuchiri ọnu. O we jide ya aka, me ka aru di ya ike, we rapu ya ka ọ la. 5 O we si ha, Ọ̀ bu nwa-nwoke ma-ọbu ehi nke onye n'etiti unu gādabà n'olùlù-miri, ma onye ahu agaghi-adọkpulite ya elu ngwa ngwa n'ubọchi-izu-ike? 6 Ma ha enweghi ike iza okwu ndia ọzọ. 7 O we turu ndi akpọrọ ilu, mb͕e Ọ ribara ama otú ha nārọrọ isi ọnọdu; nāsi ha, 8 Mb͕e ọ bula madu gākpọ gi n'oriri ọlulu-nwunye, anọdula n'isi ọnọdu; ma eleghi anya ọ kpọwori otù onye ka gi na nsọpuru, 9 onye kpọrọ gi na ya we bia si gi, Nye nwoke a ọnọdu; mb͕e ahu i gāmalite iji ihere were ọnọdu ikpe-azu. 10 Ma mb͕e ọ bula agākpọ gi, ga nọdu n'ọnọdu ikpe-azu; ka, mb͕e onye kpọworo gi gābia, ka o we si gi, Eyìm, rigo n'ọnọdu ka elu: mb͕e ahu i gēnwe otuto n'iru ndi nile gi na ha nānọdu na nri. 11 N'ihi na onye ọ bula nke nēweli onwe-ya elu, agēweda ya; ọzọ, onye nēweda onwe-ya, agēweli ya elu. 12 O we si kwa onye kpọrọ Ya-ri, Mb͕e ọ bula i siri nri-ututu ma-ọbu nri-anyasi, akpọla ndi-eyì-gi, ma-ọbu umu-nne-gi, ma-ọbu ndi-ikwu-gi, ma-ọbu ndi-ab͕ata-obi-gi, bú ndi ọgaranya; ka ha onwe-ha we ghara ikpọghachi kwa gi ma eleghi anya, ewe nyeghachi gi ihe. 13 Kama mb͕e ọ bula i siri nri uku, kpọ ndi-ob͕eye, ndi-ọlusi, ndi-ngwurọ, ndi-ìsì: 14 onye-ngọzi ka i gābu; n'ihi na ha enweghi ihe inyeghachi gi: n'ihi na agēnyeghachi gi na nbilite-n'ọnwu nke ndi ezi omume. 15 Ma mb͕e otù onye nime ndi soro Ya nọdu na nri nuru ihe ndia, ọ si Ya, Ngọzi nādiri onye gēri nri n'ala-eze Chineke. 16 Ma Ọ siri ya, Otù nwoke siri nri-anyasi uku; we kpọ ọtutu madu: 17 o we zipu orù-ya n'oge hour nke nri-anyasi ahu isi ndi akpọwori, Bianu; n'ihi na edoziwo ihe nile ab͕u a. 18 Ma ha nile were otù olu malite iriọ ka arapu ha. Onye mbu siri ya, Azutaram ubi, ọ dikwam nkpà ipu gāle ya: ariọm gi guam n'onye riọrọ ka arapu ya. 19 Onye ọzọ si-kwa-ra, Azutaram ehi ọlu iri ejikọrọ abua abua, anamaga kwa inwa ha: ariọm gi guam n'onye riorọ ka arapu ya. 20 Onye ọzọ sikwara, Alurum nwunye, n'ihi nka apughi m ibia. 21 Orù ahu we bia, kọrọ onye-nwe-ya ihe ndia. Mb͕e ahu nna-nwe-ulo ahu, ebe iwe were ya, ọ si orù-ya, Pua ọsọsọ ga n'amá nile na uzọ ntà nile nke obodo, kpọbata n'ebe a ndi-ob͕eye na ndi-ọlusi na ndi-ìsì na ndi-ngwurọ. 22 Orù ahu we si, Onye-nwe-ayi, emewo ihe i nyere n'iwu, ọnọdu fọdu-kwa-ra. 23 Onye-nwe-ulo ahu we si orù-ya Pua ga n'uzọ nile na ogige nile, rugide kwa madu ka ha bata, ka ulom we juputa. 24 N'ihi na asim unu, na ọ dighi otù onye nime ndikom ahu ndi akpọworo gēdetu nri-anyasim ire. 25 Ma oké ìgwè madu nēso ya je: O we chigharia, si ha, 26 Ọ buru na onye ọ bula abiakutem, ma ọ kpọghi nna nke ya asì, ya na nne nke ya, na nwunye nke ya, na umu nke ya, na umu-nne-ndikom nke ya, na umu-nne-ndinyom nke ya, e, ndu nke aka ya kwa, ọ pughi ibu onye nēso uzọm. 27 Onye ọ bula nke nēbughi obe nke aka ya, sokwam n'azu, ọ pughi ibu onye nēso uzọm. 28 N'ihi na ònye nime unu, nke nāchọ íwu ulo-elu, nēbughi uzọ nọdu ala gu ego ọ gēwe, ma o nwere ego ọ gēji lusia ya? 29 Ka ndi nile ndi nāhu ya we ghara imalite ime ya ihe-ọchì ma eleghi anya, mb͕e ọ tọsiri ntọ-ala-ya, ma o nweghi ike iwuzu ya, 30 si, Nwoke a malitere iwu ulo, ma o nweghi ike iwusi ya. 31 Ma-ọbu òle eze, mb͕e ọ nāga ibu agha megide eze-ibe-ya, nāgaghi-ebu uzọ nọdu ala b͕a ìzù ma ọ puru ichi orú nnù ndi-agha na nnù ise zute onye chiri ọgu nnù ndi-agha abua na nnù iri bia imegide ya? 32 Ma ọ buru na ọ pughi, mb͕e onye ahu nọ n'ebe di anya ub͕u a, o ziga ndi-ozi, riọ ihe gēweta udo. 33 Ya mere otú a, onye ọ bula nime unu nke nāb͕akutaghi ihe nile o nwere azú, ọ pughi ibu onye nēso uzọm. 34 Ya mere, nnú di nma: ma asi na ọbuná nnú etufuwo utọ-ya, àgēji gini me ya ka ọ di utọ? 35 O kwesighi ala ma-ọbu ebe anēkpofu ǹsí-anu: ha nātupu ya n'èzí. Onye nwere nti inu ihe, ya nuru.

Luk 15

1 Ma ndi-ọna-utu na ndi-nmehie nile nābiaru Ya nso inu okwu-Ya. 2 Ndi-Farisi na ndi-ode-akwukwọ we nātamu, si Nwoke a nānara ndi-nmehie nke-ọma, nēso kwa ha eri ihe. 3 O we tuara ha ilu a, si, 4 Òle madu di n'etiti unu, nke nwere ọgu aturu ise, ma otù nime ha funariri ya, nke nārapughi ọgu anọ na iri na iteghete ahu n'ọhia, ga so nke furu efu, rue mb͕e ọ gāchọputa ya? 5 Mb͕e ọ chọputaworo ya, we tukwasi ya n'ùbú-ya abua, nāṅuri. 6 Mb͕e ọ biaworo n'ulo, o we kpọkọta ndi-eyì-ya na ndi-ab͕ata-obi-ya, si ha, Sonum ṅuri ọṅu, n'ihi na achọputawom aturum furu efu. 7 Asim unu, na otú a ọṅu gādi n'elu-igwe n'isi otù onye-nmehie nke nēchèghari, kari n'isi ọgu ndi ezi omume anọ na iri na iteghete, ndi nchèghari nādighi nkpà. 8 Ma-ọbu òle nwanyi nke nwere shilling iri, ọ buru na otù shilling efunari ya, nāmuyeghi oriọna, za ulo-ya, chọsi ike rue mb͕e ọ gāchọputa ya? 9 Mb͕e ọ chọputaworo ya, o we kpọkọta ndi-eyì-ya na ndi-ab͕ata-obi-ya, si, Sonum ṅuri ọṅu, n'ihi na achọputawom shilling nke funariworom-ri. 10 Asim unu, na otù a ọṅù di n'iru ndi-mọ-ozi Chineke n'isi otù onye-nmehie nke nēchèghari. 11 O we si, Otù nwoke ji umu-ndikom abua: 12 nke bu nwata nime ha we si nna-ya, Nna, nyem òkè nke ihe i nwere nke rurum. O we kewara ha ihe nile o ji biri. 13 Mb͕e ọtutu ubọchi agabigaghi nwa-ya nke-nwata ahu we kporo ihe nile, je ala ọzọ di anya; n'ebe ahu ka o mefuru ihe o nwere n'idi ndu nke ila-n'iyì. 14 Ma mb͕e o mefusiri ihe nile, oké unwu siri ike dara n'ala ahu; ya onwe-ya we malite inọ na nkpà. 15 O we ga were onwe-ya rapara n'otù onye nime ndi amuru n'ala ahu; o we ziga ya n'ubi-ya izù ezì. 16 O we nāgu ya iwere mb͕ub͕ọ nke ezì nāta riju afọ-ya: ma ọ dighi onye ọ bula nēnye ya. 17 Ma mb͕e ọ mara onwe-ya ọ si, Ọ̀tutu ndi egoro ọlu ole nke nnam nwebigara ob͕e achicha ókè, ma mu onwem nāla n'iyì n'oké agu n'ebe a! 18 M'gebili jekuru nnam, m'gāsi kwa ya, Nna, emehiewom megide elu-igwe, na n'iru gi: 19 ekwesighi m ka akpọkwam nwa-gi ọzọ: mem ka m'di ka otù onye nime ndi nke gi egoro ọlu. 20 O we bilie, biakute nna-ya. Ma mb͕e ọ nọ n'ebe di anya ub͕u a, nna-ya huru ya, o we nwe ọmiko n'aru-ya, b͕a ọsọ, makua ya n'olu, sutu kwa ya ọnu nke-uku. 21 Nwa-ya we si ya, Nna, emehiewom megide elu-igwe, na n'iru gi: ekwesighi m ka akpọkwam nwa-gi ọzọ. 22 Ma nna-ya siri ndi-orù-ya, Chiputa uwe-nwuda nke kachasi nma ọsọsọ, were ya yikwasi ya; tiye kwa nb͕a-aka n'aka-ya, na akpukpọ-ukwu n'ukwu-ya: 23 sekputa kwa nwa-ehi azùru azù, b͕ue ya, ka ayi ri kwa, ka obi tọ kwa ayi utọ: 24 n'ihi na nwam nka nwururi anwu, o we di ndu ọzọ; o fururi efu, ewe hu ya. Ha we malite ime ka obi tọ ha utọ. 25 Ma nwa-ya nke-okenye nọ n'ubi: mb͕e ọ nābia ru ulo nso, o we nu olu abù na ite-egwú. 26 O we kpọ otù onye nime ndi nēje ozi ka ọ biakute ya, we jua ya ihe ha bu, bú ihe ndia. 27 O we si ya, Nwa-nne-gi abiawo; nna-gi eb͕uwo kwa nwa-ehi azùru azù, n'ihi na ọ nara ya n'aru-ike. 28 Ma o were iwe, ọ chọghi kwa ibà n'ulo: nna-ya we puta, riọ ya. 29 Ma ọ zara, si nna-ya, Le, ọtutu arọ ndia ka m'bu orù-gi, ọ dighi kwa mb͕e ọ bula m'rapuru ihe i nyere n'iwu: ma ọ dighi mb͕e ọ bula i nyerem nwa-ewu, ka obi we tọ mu na ndi-eyìm utọ: 30 ma mb͕e nwa-gi nka biara, nke ya na ndinyom ndi nākwa iko ripiara ihe nile i ji biri, i b͕uru nwa-ehi azùru azù nye ya. 31 O we si ya, Nwam, mu na gi nọ mb͕e nile, ihem nile bu kwa nke gi. 32 Ma ayi aghaghi ime ka obi tọ ayi utọ na iṅuri ọṅu: n'ihi na nwa-nne-gi nka nwururi anwu, o we di ndu ọzọ; o fukwara efu, ewe hu ya.

Luk 16

1 O we si kwa ndi nēso uzọ-Ya, Otù ọgaranya di, nke nwere onye nāchi èzí-na-ulo-ya; onye a ka eboro n'iru ya na ọ nēmefu ihe o nwere. 2 Ọ we kpọ ya, si ya, Ọ̀ bu gini bu nka nke m'nānu bayere gi? kọrọm akukọ nke ọchichi-èzí-na-ulo-gi; n'ihi na i pughi ichi èzí-na-ulo ọzọ. 3 Onye ahu nke nāchi èzí-na-ulo we kwue n'onwe-ya, si, Gini ka m'gēme, n'ihi na onye-nwem nānapum ọchichi-èzí-na-ulo a? Enweghi m ike igwu ala; ihere iriọ aririọ nēmem. 4 Amaram ihe m'gēme, ka, mb͕e ọ bula agēwepum n'ọchichi-èzí-na-ulo a, ka ha we kpọbatam n'ulo nke aka ha. 5 O we kpọ ndi nile ji onye-nwe-ya ugwọ n'otù n'otù, si onye mbu, Ùgwọ ole ka i ji onye-nwem? 6 Ọ si, Ọgu mb͕é manu ise. Ọ si ya, Were akwukwọ-gi, nọdu ọsọsọ, de ọgu abua na iri. 7 Mb͕e ahu ọ siri onye ọzọ, Ùgwọ ole ka gi onwe-gi ji kwa? Ọ si, Ọgu mb͕é ọka ise. Ọ si ya, Were akwukwọ-gi, de ọgu anọ. 8 Onye-nwe-ya we to onye ahu nāchi èzí-na-ulo nke nēme ajọ omume, n'ihi na o mere dika onye nwere uche: n'ihi na umu nke oge a nwere uche n'ebe ọb͕ọ nke aka ha nọ kari umu nke ìhè. 9 Mu onwem nāsi kwa unu, Menu ndi-eyi nye onwe-unu site n'àkù nke ajọ omume; ka, mb͕e ọ bula ọ gāgwu, ka ha we kpọbata unu n'ulo-ikwū ebighi-ebi. 10 Onye kwesiri ka atukwasi ya obi n'ihe dikarisiri ntà kwesi-kwa-ra ka atukwasi ya obi n'oké ihe: onye bu kwa onye ajọ omume n'ihe dikarisiri ntà bu kwa onye ajọ omume n'oké ihe. 11 Ya mere, ọ buru na unu abughi ndi kwesiri ka atukwasi unu obi n'àkù ajọ omume, ònye gēnye ezi àkù n'aka-unu na ntukwasi-obi idebe? 12 Ọ buru kwa na unu abughi ndi kwesiri ka atukwasi unu obi n'ihe onye ọzọ nwere, ònye gēnye unu ihe nke aka unu? 13 Ọ dighi onye ọ bula nke nēje ozi nke puru ibu orù nke nna abua: n'ihi na ọ gākpọ otù onye nime ha asì, hu ibe-ya n'anyá; ma ọ bughi otú a ọ gējide otù, lelìa ibe-ya anya. Unu apughi ibu orù Chineke na àkù. 14 Ma ndi-Farisi, ndi nāhu ego n'anya, nuru ihe ndia nile: ha we me Ya ihe-ọchì. 15 O we si ha, Unu onwe-unu bu ndi nāgu onwe-unu na ndi ezi omume n'anya madu; ma Chineke mara obi-unu: n'ihi na ihe di elu n'etiti madu bu ihe-árú n'anya Chineke. 16 Iwu Chineke na ndi-amuma-Ya di rue oge Jọn: site n'oge ahu anēzisa ozi ọma ala-eze Chineke, madu nile n'otù n'otù were ihe-ike nābà nime ya. 17 Ma ọ ka nfé ka elu-igwe na ala gabiga, kari na otù ihe dikarisiri ntà n'iwu ahu gāda. 18 Nwoke ọ bula nke nārapu nwunye-ya, nke luru kwa nwanyi ọzọ, ọ nākwa iko: onye nālu nwanyi nke di-ya rapuworo nākwa kwa iko. 19 Ma otù ọgaranya di, o nēyi kwa uwe ododo na ezi ákwà ọcha, ọ nēme kwa ka obi nātọ ya utọ nke-ọma kwa-ubọchi: 20 ma atọb͕ọrọri otù ob͕eye n'ọnu-uzọ-amá-ya, aha-ya bu Lazarọs, nke ọnyá juru ya n'aru, 21 onye ọ nāgu kwa ka ewere irighiri nri nke si na table nke ọgaranya ahu dapu me ka afọ ju ya; e, ọbuná nkita nābia racha ọnyá-ya. 22 O we rue na ob͕eye ahu nwuru, ndi-mọ-ozi we bupu ya ga n'ebe ọ dabere n'obì Abraham: ọgaranya ahu nwukwara, ewe lìe ya. 23 Nime Hedis o we welie anya-ya elu, ebe ọ nọ na nmekpa-aru, ọ hu Abraham n'ebe di anya, na Lazarọs ka ọ dabere n'obì-ya. 24 Ọgaranya ahu we kpọ òkù, si, Nna, Abraham, merem ebere, zite Lazarọs, ka ọ detu ọnu-ọ̀nu nkpisi-aka-ya na miri, we mejua irem; n'ihi na anọm n'aru-ufu nime ire-ọku a. 25 Ma Abraham síri, Nwam, cheta na i nara ezi ihe-gi na ndu-gi, otù ahu Lazarọs narakwara ajọ ihe-ya: ma ub͕u a anākasi ya obi n'ebe a, ma gi onwe-gi nọ n'aru-ufu. 26 Ma n'ihe ndia nile, emewo ka oké olùlù disie ike n'ab͕ata ayi na unu, ka ndi nāchọ isi n'ebe a gabiga ijekuru unu we ghara inwe ike, ka onye ọ bula ghara kwa isi n'ebe ahu gabiga biakute ayi. 27 O we si, Ya mere ariọm gi, nna, ka i ziga ya n'ulo nnam; 28 n'ihi na enwerem umu-nne ise; ka o we dọ ha aka na nti, ka ha onwe-ha ghara ibia kwa n'ebe nmekpa-aru a. 29 Ma Abraham siri, Ha nwere Moses na ndi-amuma; ka ha nuru olu-ha. 30 O we si, É-è, nna Abraham: kama ọ buru na otù onye esite na ndi nwuru anwu jekuru ha, ha gēchèghari. 31 O we si ya, Ọ buru na ha anughi olu Moses na ndi-amuma, agaghi-eme kwa ka ha kweye, asi na otù onye esi na ndi nwuru anwu bilie.

Luk 17

1 O we si ndi nēso uzọ-Ya, Ọ bu ihe nāghaghi ime na ihe di ìche iche nēme ka madu ma n'ọnyà gābia: ma ahuhu gādiri onye ahu, nke ha nēsite n'aka-ya bia. 2 Ọ gakara ya-ri mma ma akwuba ya nkume-igwe-nri n'olu, tubà kwa ya n'oké osimiri, kari na ọ gēme ka otù onye nime ndi ntà ndia ma n'ọnyà. 3 Nēzenu onwe-unu: ọ buru na nwa-nna-gi emehie, bara ya nba; ọ buru kwa na ọ chègharia, b͕aghara ya. 4 Ọ buru kwa na o mehiere megide gi ub͕ò asa n'otù ubọchi, we chigharia ọzọ n'ebe i nọ ub͕ò asa, si, Echègharim; i gāb͕aghara ya. 5 Ndi-ozi-Ya we si Onye-nwe-ayi, Tukwasiri ayi okwukwe. 6 Onye-nwe-ayi we si, Ọ buru na unu nwere okwukwe dika nkpuru mustard, unu gāsi osisi sycamine nka, Ka eropu gi, ku kwa gi n'oké osimiri; ọ gāṅa kwa unu nti. 7 Ma ònye n'etiti unu, asi na o nwere orù nke nālu ọlu ubi ma-ọbu nke nāzù aturu, gāsi ya, mb͕e o si n'ubi bata n'ulo, Bia ngwa ngwa nọdu na nri; 8 nke nāgaghi-asi kwa ya kama nke ahu, Dozie ihe m'gēri na nri-anyasi, ke kwa ihe-ọkiké n'úkwù-gi, nējerem ozi, rue mb͕e m'risiri ṅu kwa; ma emesia gi onwe-gi gēri ṅu kwa? 9 Ọ̀ nwere ekele n'ebe orù ahu nọ n'ihi na ọ mere ihe akaworo àkà? 10 Otú a unu onwe-unu kwa, mb͕e ọ bula unu gēmesi ihe nile akaworo àkà nye unu, sinu, Ayi bu orù ndi nābaghi n'ihe; ayi emewo ihe ayi ji ugwọ ime. 11 O rue, mb͕e ha nāga Jerusalem, na Ya onwe-ya nāgabiga n'etiti Sameria na Galili. 12 Mb͕e Ọ nābà n'otù obodo ntà, ndikom iri, bú ndi-ekpenta, we zute Ya, ndi guzoro n'ebe di anya: 13 ha we welie olu-ha elu, si, Jisus, Nna-ayi, mere ayi ebere. 14 Mb͕e Ọ huru ha, O we si ha, Ganu, were onwe-unu gosi ndi-nchu-àjà. O we rue, mb͕e ha nāga, na emere ka aru-ha di ọcha. 15 Ma otù onye n'etiti ha, mb͕e ọ huru na emere ka aru di ya ike, ọ laghachi, were oké olu nenye Chineke otuto; 16 o we da kpuchie iru-ya n'ala n'ukwu-Ya, nēkele Ya: onye ahu bu kwa onye Sameria. 17 Ma Jisus zara, si, Èmeghi ka aru ndikom iri ahu di ọcha? ma òle ebe iteghete fọduru no? 18 Àhughi ndi laghachiri inye Chineke otuto, ma-ọbughi onye ala ọzọ a? 19 O we si ya, Bilie, ga nke gi: okwukwe-gi azọputawo gi. 20 Ma mb͕e ndi-Farisi juru Ya mb͕e ala-eze Chineke gābia, Ọ zara ha, si, Ala-eze Chineke adighi-abia mb͕e madu nēche nche: 21 ha agaghi-asi kwa, Le, n'ebe a! ma-ọbu, N'ebe ahu! n'ihi na le, ala-eze Chineke di n'etiti unu. 22 O we si ndi nēso uzọ-Ya, Ubọchi gāba, mb͕e agu ihu otù nime ubọchi Nwa nke madu gāgu unu, ma unu agaghi-ahu ya. 23 Ha gāsi kwa unu, Le, n'ebe ahu! Le, n'ebe a! unu ejela, unu esokwala ha: 24 n'ihi na dika àmùmà, mb͕e ọ nēb͕u àmùmà site n'otù akuku n'okpuru elu-igwe, ọ nēnwu rue akuku ọzọ n'okpuru elu-igwe; otú a ka Nwa nke madu gādi n'ubọchi-Ya. 25 Ma Ọ ghaghi ibu uzọ hu ọtutu ahuhu, aghaghi kwa iju Ya site n'ọb͕ọ a. 26 Ma dika emere n'ubọchi Noa, otú a ka ọ gādi kwa n'ubọchi Nwa nke madu. 27 Ha nēri ihe, ha nāṅu ihe-ọṅuṅu, ha nālu nwunye, anēnye ha n'ọlulu-di, rue ubọchi Noa batara n'ub͕ọ-ya, oké iju-miri ahu we bia, la ha nile n'iyì. 28 Otú ahu dika emere n'ubọchi Lot; ha nēri ihe, ha nāṅu ihe-ọṅuṅu, ha nāzú, ha nēre, ha nāku ihe n'ubi, ha nēwu ulo; 29 ma n'ubọchi Lot siri na Sọdọm puta ọku na brimstone si n'elu-igwe zò, we la ha nile n'iyì: 30 n'otù aka ahu ka ọ gādi n'ubọchi agēkpughe Nwa nke madu. 31 N'ubọchi ahu, onye gānọ n'elu ulo, ma ihe-ya di nime ulo, ya ghara iridata ikwapu ha: otú ahu onye nọ kwa n'ubi, ya ghara ilaghachi. 32 Chetanu nwunye Lot. 33 Onye ọ bula nke gāchọ uzọ izutara onwe-ya ndu-ya, o gētufu ya: ma onye ọ bula nke gētufu ndu-ya gēme ya ka ọ di ndu. 34 Asim unu, N'abali ahu madu abua gādi n'elu otù ihe-ndina; agēwere otù nime ha, rapu ibe-ya. 35 Ndinyom abua ganēgwekọ nri n'otù ebe; agēwere otù nime ha, ma agārapu ibe-ya. 36 Madu abua gāno kwa n'ubi; agēwere otù rapu kwa ibe-ya. 37 Ha we za, si Ya, Òle ebe, Onye-nwe-ayi? Ọ si ha, Ebe ozu di, n'ebe ahu ka udele gēzukọ kwa.

Luk 18

1 O we turu ha ilu izí ha na ha aghaghi ikpe ekpere mb͕e nile, na ighara ikwe ka ike gwu ha; 2 si, Otù onye-ikpé nọ n'otù obodo, onye nādighi-atu egwu Chineke, nke nādighi-asọpuru kwa madu: 3 otù nwanyi nke di-ya nwuru nọ kwa n'obodo ahu; nwanyi ahu we nābiakute ya, nāsi, Kpeputam n'aka onye-irom. 4 Ma na mbu ọ chọghi ime ya: ma emesia ọ siri n'onwe-ya, Ọ bu ezie na adighi m-atu egwu Chineke, adighm-asọpuru kwa madu; 5 ma n'ihi na nwanyi a di-ya nwuru nēsobum, m'gēkpeputa ya, ka ọ ghara ime ka ike gwusiam site n'ọbibia ọ nābia mb͕e nile. 6 Onye-nwe-ayi we si, Nurunu ihe onye-ikpé nke nēme ajọ omume kwuru. 7 Ma Chineke, Ọ̀ gaghi-ekpeputa ndi nke Ya arọputara, ndi nākpọku Ya ehihie na abali, O nwe-kwa-ra ogologo ntachi-obi n'ebe ha nọ? 8 Asim unu, na Ọ gēkpeputa ha ọsọsọ. Otú ọ di, mb͕e Nwa nke madu gābia, Ọ̀ gāhu okwukwe n'elu uwa? 9 O we tu kwa ilu a nye ufọdu ndi tukwasiri obi n'onwe-ha na ha bu ndi ezi omume, ndi kpọkwara ndi nile fọduru ihe-efu: 10 Ndikom abua rigoro n'ulo uku Chineke ikpe ekpere; otù nime ha bu onye-Farisi, ibe-ya bu onye-ọna-utu. 11 Onye-Farisi guzoro nēkpe ekpere nye onwe-ya otú a, si, Chineke, ekelem Gi, na adighi m ka ndi fọduru n'etiti madu, ndi nāpunara madu ihe, ndi ajọ omume, ndi nākwa iko, ma-ọbu dika ọbuná onye-ọna-utu a. 12 Anamebu ọnu ub͕ò abua n'ízù ubọchi asa; anamenye otù uzọ n'uzọ iri n'ihe nile, ka ha ra, bú nke m'natara. 13 Ma onye-ọna-utu ahu guzoro n'ebe di anya, ọ chọghi kwa iweli ọbuná anya-ya le elu-igwe, kama ọ nēti aka n'obi-ya, si, Chineke, ka obi-Gi juru n'ebe mu, bú onye-nmehie, nọ. 14 Asim unu, Nwoke a ridara n'ulo-ya buru onye aguworo n'onye ezi omume kari ibe-ya: n'ihi na onye ọ bula nke nēweli onwe-ya elu, agēweda ya; ma onye nēweda onwe-ya, agēweli ya elu. 15 Ha we kutakwara Ya umu ọhu ha, ka O we metu ha aka: ma mb͕e ndi nēso uzọ-Ya huru ya, ha bara ha nba. 16 Ma Jisus kpọrọ ha biakute Ya, si, Kwenu ka umu-ntakiri biakutem, unu eb͕ochi-kwa-la ha: n'ihi na ala-eze Chineke bu nke ndi di otú a. 17 N'ezie asim unu, Onye ọ bula nke nāgaghi-anara ala-eze Chineke dika nwatakiri, ọ gaghi-abà nime ya ma-ọli. 18 Otù onye-isi we jua Ya, si, Ezi Onye-ozizí, gini ka m'gēme ka m'we keta ndu ebighi-ebi? 19 Ma Jisus siri ya, Gini mere i nākpọm ezi onye? ọ dighi onye ọ bula bu ezi onye, ma-ọbughi otù Onye, bú Chineke. 20 I matawo ihe nile enyere n'iwu, Akwala iko, Eb͕ula madu, Ezula ori, Ab͕ala àmà ugha, Sọpuru nna-gi na nne-gi. 21 Ma ọ siri, Ihe ndia nile ka m'ribara ama site n'okorọbia. 22 Ma mb͕e Jisus nuru ya, Ọ si ya, Otù ihe fọdu-kwa-ra gi ime: re ihe nile, ka ha ra, bú nke i nwere, kenye ndi-ob͕eye, i gēnwe kwa àkù n'elu-igwe: bia kwa, som. 23 Ma mb͕e ọ nuru ihe ndia, o wutara ya nke-uku; n'ihi na ọ bu oké ọgaranya. 24 Ma ebe Jisus huru ya, Ọ si, Le otú ọ diri ndi nwere àkù ike ibà n'ala-eze Chineke! 25 N'ihi na ọ dikariri kamel nfé isite n'anya àgìgá ba nime, kari ọgaranya ibà n'ala-eze Chineke. 26 Ma ndi nuru ya siri, Ònye kwa ka apuru izọputa? 27 Ma Ọ siri, Ihe anāpughi ime n'ebe madu nọ apuru ime n'ebe Chineke nọ. 28 Pita we si, Le, ayi onwe-ayi rapuru ihe nile nke aka ayi, we so Gi. 29 O we si ha, N'ezie asim unu, Ọ dighi onye ọ bula nke rapuru ulo, ma-ọbu nwunye, ma-ọbu umu-nne, ma-ọbu ndi muru ya, ma-ọbu umu, n'ihi ala-eze Chineke, 30 nke nāgaghi-anata kari ọtutu ihe n'oge a, nata kwa ndu ebighi-ebi n'oge nke nābia. 31 O we kuru ndi-ozi iri na abua ahu tiyere Onwe-ya, si ha, Le, ayi nārigoro Jerusalem, ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ site n'aka ndi-amuma gēmezu n'ebe Nwa nke madu nọ. 32 N'ihi na agārara Ya nye n'aka ndi mba ọzọ, me kwa Ya ihe-ọchì, me kwa Ya ihe-ihere, busa kwa Ya ọnu-miri: 33 ha gāpia kwa Ya ihe, b͕ue Ya: n'ubọchi nke-atọ Ọ gēsi kwa n'ọnwu bilie. 34 Ma ndi ahu aghọtaghi ihe ọ bula n'ihe ndia; ezonari-kwa-ra ha okwu a, ha amaghi kwa ihe anēkwu. 35 O rue, mb͕e Ọ nābiaru Jeriko nso, otù onye-ìsì nānọdu n'akuku uzọ nāriọ aririọ: 36 ma ebe ọ nuru ùzù ìgwè madu ka ha nāgabiga, ọ jua isi ihe a. 37 Ha we kọrọ ya, na Jisus Onye Na-zaret nāgabiga. 38 O we tie nkpu, si, Jisus, Nwa Devid, merem ebere. 39 Ndi bu uzọ ga we bara ya nba, ka o kpuchie ọnu-ya: ma onye ahu tikariri nkpu nke-uku, si, Nwa Devid, merem ebere. 40 Jisus we guzo, si ka eduru ya biakute Ya: ma mb͕e ọ biara nso, Ọ jua ya, si, 41 Gini ka i nāchọ ka M'mere gi? Ọ́ si, Onye-nwe-ayi, ka eme ka m'hu uzọ. 42 Jisus we si ya, Ka eme ka i hu uzọ: okwukwe-gi azọputawo gi. 43 Ngwa ngwa ewe me ka ọ hu uzọ, o we nēso Ya, nēnye Chineke otuto: ndi-Ju nile, mb͕e ha huru ya, ha we to Chineke.

Luk 19

1 O we ba na Jeriko nāgabiga kwa n'etiti ya. 2 Ma le, otù nwoke anākpọ aha-ya Zakiọs; onye ahu bu kwa onye-isi-ọna-utu, onye ahu bu kwa ọgaranya. 3 O we chọ uzọ ihu Jisus imata onye Ọ bu; ma ọ pughi n'ihi ìgwè madu, n'ihi na o toghi ogologo. 4 O we b͕a ọsọ ga n'iru, we rigo n'osisi sycomore ka ọ hu Ya anya: n'ihi na Ọ gaje igabiga n'uzọ ahu. 5 Mb͕e Jisus biaruru ebe ahu, O we le anya n'elu, si ya, Zakiọs, me ngwa, ridata; n'ihi na aghaghi m inọdu n'ulo-gi ta. 6 O we me ngwa, ridata, were kwa ọṅù kpọbata Ya. 7 Mb͕e ha huru ya, ha nile we nātamu, si, Ọ bàra inọ ọnọdu-abali n'ulo nwoke bu onye-nmehie. 8 Zakiọs we guzọ, si Onye-nwe-ayi, Le, Onye-nwe-ayi, nkera ihe m'nwere ka m'gēnye ndi-ob͕eye; ọ buru kwa na anaram onye ọ bula ihe site n'ebubo ugha, m'gēnyeghachi anọ anọ. 9 Jisus we si ya, Ta ka nzọputa biaruru ulo a, ebe ya onwe-ya bu kwa nwa Abraham. 10 N'ihi na Nwa nke madu biara ichọ na izọputa ihe nke furu efu. 11 Ma mb͕e ha nānu ihe ndia, Ọ tukwasi tu ilu, n'ihi na Ọ nọ Jerusalem nso, na n'ihi na ha nēchè na ala-eze Chineke gaje iputa ìhè ngwa ngwa. 12 Ya mere Ọ siri, Otù nwoke amazuru aha-ya gara ala di anya, inara ala-eze nye onwe-ya, na ilaghachi. 13 O we kpọ madu iri nime ndi-orù-ya, nye ha ọgu pound abua na iri, si ha, Zuanu ahia rue mb͕e m'gābia. 14 Ma ndi-obodo-ya kpọrọ ya asì, ha we zìe ndi-ozi ga n'azu ya, si, Ayi achọghi ka nwoke a buru eze-ayi. 15 O we rue, mb͕e ọ laghachiri ọzọ, mb͕e ọ natasiri ala-eze-ya, na ọ siri ka akpọ ndi-orù ahu, ndi ọ nyereri ego ahu, ka ha biakute ya, ka o we mara ihe ha zutarari n'ahia. 16 Onye mbu we bia n'iru ya, si, Onye-nwe-ayi, pound ise nke gi abawo urù ọgu pound abua na iri. 17 Ọ we si ya, I mere nke-ọma, ezi orù: n'ihi na ahuru na i kwesiri ka atukwasi gi obi n'ihe dikarisiri ntà, gi buru onye nāchi obodo iri. 18 Nke-abua we bia, si, Onye-nwe-ayi, pound ise nke gi abawo urù orú pound na ise. 19 O we si kwa nwoke a, Gi onwe-gi buru kwa onye-isi nke obodo ise. 20 Orù nke di iche we bia, si, Onye-nwe-ayi, le pound ise nke gi, nke m'debere n'ákwà: 21 n'ihi na aturum gi egwu, n'ihi na i bu onye aka ike: i nēweli ihe i nātọb͕ọghi, i nēwe kwa ihe n'ebe ikọghi. 22 Ọ si ya, M'gēsite n'ọnu nke gi kpe gi ikpé, ajọ orù. I mara na mu onwem bu onye aka ike, nēweli ihe m'nātọb͕ọghri, nēwe kwa ihe m'nāghaghri; 23 n'ihi gini kwa ka i nējighi were egom nye ndi nāb͕anwe ego, mu onwem gānara kwa ya na uma mb͕e m'biara? 24 O we si ndi guzoro nso, Napunu ya pound ise ahu, were ha nye onye nwere ọgu pound abua na iri ahu. 25 Ha we si ya, Onye-nwe-ayi, o nwere ọgu pound abua na iri. 26 Asim unu, na onye ọ bula nke nwere ka agēnye; ma onye nēnweghi, ọbuná ihe o nwere ka agānapu ya. 27 Otú ọ di, ndi-irom ndia, ndi nāchọghi ka m'buru eze-ha, kuta ha n'ebe a, b͕ue ha n'irum. 28 Mb͕e O kwusiri okwu ndia, O we nāga n'iru, nārigoro Jerusalem. 29 O rue, mb͕e Ọ biaruru Betfagi na Betani nso, n'uzọ ugwu anākpọ ugwu Olive, na O zigara madu abua n'etiti ndi nēso uzọ-Ya, 30 si, Jenu n'obodo ntà nke di na ncherita-iru unu; mb͕e unu nābà, unu gāhu nime ya nwa-inyinya-ibu elibeworo, nke madu ọ bula akānọkwasigh: tọpunu ya, sekputa ya. 31 Ọ buru kwa na onye ọ bula ajua unu, si, N'ìhi gini ka unu nātọpu ya? unu gāsi otú a, Ọ di Onye-nwe-ayi nkpà. 32 Ndi ezigara we je, hu dika Ọ gwara ha. 33 Ma mb͕e ha nātọpu nwa-inyinya-ibu ahu, ndi-nwe-ya we si ha, Gini mere unu nātopu nwa-inyinya-ibu ahu? 34 Ha we si, Ọ di Onye-nwe-ayi nkpà. 35 Ha we sekputa ya nye Jisus: ha we wukwasi uwe-ha na nwa-inyinya-ibu ahu, we tukwasi Jisus na ya. 36 Mb͕e Ọ nāga, ha we tusa uwe-ha n'uzọ. 37 Ma mb͕e Ọ nābiaru Jerusalem nso ub͕u a, n'uzọ nrida nke ugwu Olive, ọra ndi nile nēso uzọ-Ya malitere iṅuri ọṅu na iwere oké olu to Chineke n'ihi ọlu nile di ike nke ha hururi; 38 si, Onye agọziri agọzi ka Eze Nke nābia n'aha Onye-nwe-ayi bu: udo di n'elu-igwe, otuto di kwa n'ebe kachasi ihe nile elu. 39 Ufọdu n'etiti ndi-Farisi we si n'ìgwè madu ahu si Ya, Onye-ozizí, bara ndi nēso uzọ-Gi nba. 40 O we za, si, Asim unu na, ọ buru na ndia ekpuchi ọnu-ha, nkume gēti nkpu. 41 Mb͕e Ọ biaruru Jerusalem nso, O we hu obodo ahu we kwara ya ákwá, 42 si, Ọ buru na i mara n'ubọchi a, ọbuná gi onwe-gi, ihe gēweta udo! ma ub͕u a ezonariri ha n'anya-gi. 43 N'ihi na ubọchi gābiakwasi gi, mb͕e ndi-iro-gi gēgwu ékpè na ìgá imegide gi, nọgide kwa gi gburugburu, jigide kwa gi n'akuku nile, 44 tuda kwa gi n'ala, na umu-gi bi nime gi; ha agaghi-arapu kwa nime gi otù nkume n'elu nkume-ibe-ya; n'ihi na i maghi oge nleta-gi. 45 O wee ba n'ulọ uku Chineke, malite ichupu ndi nēre, 46 nāsi ha, Edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ulom gābu kwa ulo ekpere: ma unu onwe-unu mere ya ọb͕à ndi nāpunara madu ihe. 47 O we nēzí ihe kwa-ubọchi n'ulo uku Chineke. Ma ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ na ndi-isi nke ndi-Ju nāchọ uzọ ila Ya n'iyì: 48 ha ahughi kwa ihe ha gēme; n'ihi na ndi-Ju nile nọ Ya nso gburugburu, nānu okwu-Ya.

Luk 20

1 O we rue, n'otù nime ubọchi ahu, mb͕e Ọ nēzí ndi-Ju ihe n'ulo uku Chineke, nēzì kwa ozi ọma, na ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ, ha na ndi-okenye, we guzo Ya nso; 2 ha we kwue, si Ya, Gwa ayi: Ọ̀ bu n'aha ike gini ka I nēme ihe ndia? ma-ọbu ònye ka ọ bu, bú onye nyere Gi ike a? 3 Ma Ọ zara, si ha, Mu onwem gāju kwa unu otù ajuju unu zakwam: 4 Baptism nke Jọn, ò sitere n'elu-igwe, ma-ọbu na o sitere n'aka madu? 5 Ha we kwurita n'etiti onwe-ha, si, Ọ buru na ayi asi, O sitere n'elu-igwe; Ọ gāsi, N'ìhi gini ka unu nējighi kwe ya? 6 Ma ọ buru na ayi asi, O sitere n'aka madu; ndi-Ju nile gēji nkume tub͕u ayi: n'ihi na emewo ka ha kweye na Jọn bu onye-amuma. 7 Ha we za, si na ha amataghi ebe o sitere. 8 Jisus we si ha, Mu onwem agaghi-agwa kwa unu aha ike M'ji eme ihe ndia. 9 O we malite ituru ndi-Ju ilu a: Otù onye kuru ubi-vini, were kwa ya tiye n'aka ndi-ọlu-ubi, we je ala ọzọ nọdu oge di anya. 10 N'oge ighọ nkpuru o we zigara ndi-ọlu-ubi ahu otù orù, ka ha we nye ya nkpuru ufọdu nke ubi-vine ahu: ma ndi-ọlu-ubi ahu piara ya ihe, zilaga ya n'aka efu. 11 O we zikwasi orù ọzọ: ha we pia kwa ya ihe, me ya ihe-ihere, zilaga ya n'aka efu. 12 O we zikwasi orù nke-atọ: ha we meru kwa onye ahu aru, we tupu ya. 13 Onye-nwe ubi-vine ahu we si, Gini ka m'gēme? m'gēziga ọkparam m'huru n'anya: eleghi anya ha gāsọpuru nwam nka. 14 Ma mb͕e ndi-ọlu-ubi ahu huru ya, ha kwurita n'etiti onwe-ha, si, Nka bu onye-nketa: ka ayi b͕ue ya, ka ihe-nketa-ya we buru nke ayi. 15 Ha we tupu ya n'azu ubi-vine ahu, b͕ue ya. Gini kwa ka onye-nwe ubi-vine ahu gēme ha? 16 Ọ gābia, la ndi-ọlu-ubi ahu n'iyì, were kwa ubi-vine ahu nye ndi ọzọ. Ma mb͕e ha nuru ya, ha si, Chineke ekwela. 17 Ma O lere ha anya, si, Gini kwa bu ihe a nke edeworo n'akwukwọ nsọ, Nkume nke ndi nēwu ulo juru, Nke ahu ka emere isi nkuku ulo? 18 Agētiwasi onye ọ bula nke dakwasiri nkume ahu; ma onye ọ bula ọ gādakwasi ya, ọ gēfesa ya ka uzuzu. 19 Ndi-ode-akwukwọ na ndi-isi-nchu-àjà we chọ uzọ itukwasi Ya aka n'otù oge hour ahu; ma ha turu egwu ndi-Ju: n'ihi na ha mara na Ọ turu ilu a imegide ha. 20 Ha we che Ya nche, we zipu ndi-nledo, ndi mere onwe-ha dika ndi ezi omume, ka ha we jide Ya n'okwu-ọnu-Ya, irara Ya nye n'aka ọchichi na ike nke onye-isi. 21 Ha we jua Ya, si, Onye-ozizí, ayi amatawo na I nēkwu nēzi kwa ihe ziri ezi, na I dighi-ele kwa madu anya n'iru, kama I nēzí uzọ Chineke n'ezi-okwu: 22 Ò ziri ezi n'iwu ka ayi tu ùtú nye Sisa, ma-ọbu na ò zighi ezi? 23 Ma Ọ matara aghughọ-ha, we si ha, 24 Gosinum otù shilling. Ònyinyo na ihe-ndekwasi nke onye ka o nwere? Ha si, Nke Sisa. 25 O we si ha, Ya mere, nyeghachinu Sisa ihe nke Sisa, nyeghachi-kwa-nu Chineke ihe nke Chineke. 26 Ha enweghi kwa ike ijide okwu-Ya n'iru ndi-Ju: ọziza-Ya we ju ha anya, ha we kpuchie ọnu-ha. 27 Ufọdu n'etiti ndi-Sadusi, ndi si na nbilite-n'ọnwu adighi, we biakute Ya; ha we jua Ya, 28 si, Onye-ozizí, Moses dere akwukwọ nye ayi, si, na ọ buru na nwa-nne-nwoke onye ọ bula anwua, mb͕e o nwere nwunye, ma onye ahu enweghi nwa, ka nwa-nne-ya nwoke kuru nwunye-ya, me ka nkpuru toputara nwa-nne-ya. 29 Ya mere, umu-nne-ndikom asa di: nke-mbu luru nwunye, we nwua nēnweghi nwa; 30 nke-abua kwa; 31 nke-atọ we kuru ya; otú ahu ha asa arapughi umu, we nwua. 32 Mb͕e ha nile nwusiri nwanyi ahu nwukwara. 33 Ya mere, na nbilite-n'ọnwu nwùnye onye n'etiti ha ka ọ gābu? n'ihi na ha asa nwere ya na nwunye. 34 Jisus we si ha, Umu nke oge a nālu nwunye, anēnye kwa ha n'ọlulu-di: 35 ma ndi aguru na ha kwesiri iru oge ahu, na iru nbilite-n'ọnwu ahu, bú isi na ndi nwuru anwu bilie, ha alughi nwunye, enyeghi kwa ha n'ọlulu-di: 36 n'ihi na ha apughi kwa inwu ọzọ: n'ihi na ha na ndi-mọ-ozi ra; ha bu kwa umu Chineke, ebe ha bu umu nbilite-n'ọnwu ahu. 37 Ma ọbuná Moses gosiri na anēme ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie, nēkwu nime ebe edere okwu bayere Osisi ntà, mb͕e ọ nākpọ Onye-nwe-ayi Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob. 38 Ma Ọ bughi Chineke nke ndi nwuru anwu, kama Ọ bu nke ndi di ndu: n'ihi na ọ bu n'ebe Ọ nọ ka madu nile di ndu. 39 Ufọdu n'etiti ndi-ode-akwukwọ we za, si, Onye-ozizí, I kwuru nke-ọma. 40 N'ihi na ha enweghi anya-ike ọzọ iju Ya ajuju ọ bula. 41 O we si ha, Hà si aṅa kwu na Kraist ahu bu nwa Devid? 42 N'ihi na Devid onwe-ya nēkwu n'akwukwọ Abù ọma, si, Onye-nwe-ayi siri Onye-nwem, Nọdu ala n'aka-nrim, 43 Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-Gi ka ihe-nb͕akwasi-ukwu nke ukwu-Gi abua. 44 Ya mere, Devid nākpọ Ya Onye-nwe-ya, Ò si kwa aṅa buru Nwa-ya? 45 Ma mb͕e ndi-Ju nile nānu okwu-Ya Ọ si ndi nēso uzọ-Ya, 46 Nēzenu ndi-ode-akwukwọ, ndi nāchọ ijeghari n'uwe-nwuda, ndi nāhu kwa ekele n'ọma-ahia nile unu n'anya, na isi oche nile n'ulo-nzukọ nile unu, na isi ọnọdu n'oriri nile unu; 47 ndi nēripia ulo ndinyom di-ha nwuru, ndi nēkpe kwa ogologo ekpere ka madu we hu ha anya: ndia gēnwe ezi ọmuma-ikpé gabigara ókè kari ndi ọzọ.

Luk 21

1 O we le anya n'elu, hu ndi-ọgaranya ka ha nātubà onyinye-ha n'ebe anēdebe ùtú anātu. 2 O we hu otù nwayi, bú ob͕eye, nke di-ya nwuru, ka ọ nātubà n'ebe ahu ego ntà abua. 3 O we si, N'ezie asim unu, Nwanyi a, bú ob͕eye, nke di-ya nwuru, ọ tubàra kari ha nile: 4 n'ihi na ndia nile sitere n'inwebiga-àkù-ókè-ha tubà n'onyinye: ma nwanyi ahu sitere n'ukọ-ya tubà ihe nile o nwere nke o ji biri. 5 Mb͕e ufọdu nēkwu okwu bayere ulo uku Chineke, na ewereri nkume ọma na ihe enyere Chineke dozie ya, O we si, 6 Ihe ndia nke unu nēkiri, ubọchi gābia, nke anāgaghi-arapu otù nkume n'ebe a n'elu nkume-ibe-ya, nke anāgaghi-akwatu n'ala. 7 Ha we jua Ya, si, Onye-ozizí, òle mb͕e ihe ndia gābu kwa? gini gābu kwa ihe-iriba-ama mb͕e ọ bula ihe ndia gaje ime? 8 O we si, Lezienu anya ka aghara iduhie unu; n'ihi na ọtutu madu gābia n'aham, si, Mu onwem bu Ya; na, Oge ahu di nso: unu esola ha n'azu. 9 Ma mb͕e ọ bula unu gānu okwu agha di iche iche na aghara di iche iche, unu atula ujọ: n'ihi na ihe ndia aghaghi ibu uzọ puta; ma ọgwugwu ihe nile adighi-eru ngwa ngwa. 10 Mb͕e ahu Ọ siri ha, Mba gēbili imegide mba ọzọ, ala-eze gēbili kwa imegide ala-eze ọzọ: 11 oké ala-ọma-jijiji gādi kwa, oké unwu na ajọ ọria nēfe efe gādi kwa n'ebe di iche iche; ihe di egwu na ihe-iriba-ama uku gādi kwa site n'elu-igwe. 12 Ma mb͕e ihe ndia nile akēmeghi, ha gātukwasi unu aka-ha, sob͕u kwa unu, nārara unu nye n'aka ulo-nzukọ na ulo-nkpọrọ, n'ebe anēduputa unu ga n'iru ndi-eze na ndi-isi n'ihi aham. 13 Ọ gāghọrọ unu àmà. 14 Ya mere, zubenu n'obi-unu, na unu agaghi-ebu uzọ tughari uche otú unu gāgọpu onwe-unu: 15 n'ihi na Mu onwem gēnye unu ọnu na amam-ihe, nke ndi nile nēmegide unu nāgaghi-apu iguzogide ma-ọbu ikwugide okwu. 16 Ma ọbuná ndi muru unu, na umu-nne-unu, na ndi-ikwu-unu, na ndi-eyì-unu, gārara unu nye; ha gēme kwa ka ufọdu nime unu nwua ọnwu. 17 Madu nile gakpọ kwa unu asì n'ihi aham. 18 Ma otù agiri-isi agaghi-esi n'isi-unu la n'iyì ma-ọli. 19 Na ntachi-obi-unu unu gānata nkpuru-obi-unu. 20 Ma mb͕e ọ bula unu gāhu Jerusalem ka achi usu-ndi-agha nọgide ya gburugburu, mb͕e ahu maranu na itọb͕ọrọ-n'efu-ya di nso. 21 Mb͕e ahu ndi nọ na Judia, ka ha b͕alaga n'ugwu; ndi nọ kwa n'etiti ya, ka ha si nime ya wezuga onwe-ha; ndi nọ kwa n'ala ọzọ, ka ha ghara ibà nime ya. 22 N'ihi na ndia bu ubọchi nkpeputa, ka ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ we mezu. 23 Ahuhu gādiri ndi di ime na ndi nēnye nwa ara na mb͕e ahu; n'ihi na oké nkpà gādi n'ala nka, iwe gādi-kwa-ra ndi-Ju. 24 Ha gāda kwa site n'ọnu mma-agha, agādọta kwa ha n'agha ga na mba nile: ndi mba ọzọ gāzọda Jerusalem n'ala, rue mb͕e oge nke mba ọzọ gēmezu. 25 Ihe-iriba-ama di iche iche gādi kwa n'anyanwu na ọnwa na kpakpando; n'elu uwa ka nkpab͕u nke mba di iche iche gādi kwa, ndi nọ n'obi abua n'ihi nbib͕o nke oké osimiri na ebili-miri; 26 madu nātub͕ọ site n'egwu, site kwa na ile-anya ihe nābiakwasi n'elu-uwa dum madu bi: n'ihi na agēme ka ike nile nke elu-igwe me nkpatu. 27 Mb͕e ahu ha gāhu kwa Nwa nke madu ka Ọ nābia n'igwe-oji, Ya na ike na oké ebube. 28 Ma mb͕e ihe ndia malitere ime, lenu anya n'elu, welikwanu isi-unu; n'ihi na nb͕aputa-unu nēru nso. 29 O we turu ha ilu: Lenu osisi fig, na osisi nile: 30 mb͕e ọ bula ha púru epú ub͕u a, unu huru ya mara kwa n'onwe-unu na mb͕e okpom-ọku di nso ub͕u a. 31 Otú a unu onwe-unu kwa, mb͕e ọ bula unu gāhu ihe ndia ka ha nāputa, maranu na ala-eze Chineke di nso. 32 N'ezie asim unu, Ọbọ a agaghi-agabiga ma-ọli, rue mb͕e ihe nile gēme. 33 Elu-igwe na uwa gāgabiga: ma okwu nile nkem agaghi-agabiga ma-ọli. 34 Ma nēzenu onwe-unu, ka aghara iwere imebiga-ajọ-ihe-ókè, na iṅubiga-manya-ókè, na ncheb͕u nke ndu a, bob͕u obi-unu ma eleghi anya, ubọchi ahu we biakwasi unu na mberede dika ọnyà; 35 n'ihi na otù a ka ọ gābiakwasi ndi nile bi n'elu uwa nile. 36 Ma murunu anya n'oge ọ bula, nāriọ aririọ, ka unu we nwe ike ib͕anari ihe nile ndia nke gaje ime, na iguzo n'iru Nwa nke madu. 37 Kwa-ubọchi O nēzí ihe n'ulo uku Chineke; kwa-abali Ọ nāpu, nānọ ọnọdu-abali n'ugwu anākpọ ugwu Olive. 38 Ndi-Ju nile nābiakute kwa Ya n'isi-ututu n'ulo uku Chineke, inu okwu-Ya.

Luk 22

1 Ma ememe achicha ekoghi-eko, nke anakpọ Ngabiga, nēru nso. 2 Ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ we nāchọ uzọ ha gēsi b͕u Ya; n'ihi na ha nātu egwu ndi-Ju. 3 Setan we ba nime Judas onye anakpọ Iskariot, onye di n'ọnu-ọgugu ndi-ozi iri na abua ahu. 4 O we je, ya na ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ọchi-agha we kparia, otú ọ gēsi rara Ya nye n'aka-ha. 5 Ha we ṅuria ọṅu, we kwekọ inye ya ego. 6 O we kwere, we nāchọ oghere irara Ya nye n'aka-ha mb͕e ìgwè madu nānọghi. 7 Ma ubọchi achicha ekoghi-eko biara, nke anāghaghi ichu àjà ngabiga. 8 O we zipu Pita na Jọn, si, Ganu, doziere ayi oriri ngabiga, ka ayi we rie. 9 Ha we si Ya, Òle ebe I nācho ka ayi dozie? 10 Ọ si ha, Le, mb͕e unu batasiri nime obodo a, otù nwoke nke bū ite miri gēzute unu; sonu ya ba n'ulo nke ọ nābà nime ya. 11 Unu gāsi kwa nna-nwe ulo ahu, Onye-ozizí si gi, Òle ebe ulo-ọbìa di, ebe Mu na ndi nēso uzọm gēri oriri ngabiga? 12 Onye ahu gēgosi kwa unu ime-ulo uku di n'elu ulo akwadebeworo: dozienu n'ebe ahu. 13 Ha we je, hu dika Ọ gwara ha-ri: ha we dozie ememe ngabiga. 14 Mb͕e oge hour ahu ruru, O we nọdu na nri, Ya na ndi-ozi-Ya. 15 O we si ha, Agu gusirim ike iso unu ri oriri ngabiga nka mb͕e Mu akāhughi ahuhu: 16 n'ihi na asim unu, M'gaghi-eri ya ma-ọli, rue mb͕e ọ gēmezu n'ala-eze Chineke. 17 O we nara iko, kele kwa, we si, Naranu nka, kè kwa ya n'etiti onwe-unu: 18 n'ihi na asim unu, M'gaghi-aṅu ihe si n'osisi vine puta ma-ọli site ugbu a, rue mb͕e ala-eze Chineke gābia. 19 O we nara ob͕e achicha, kele kwa, we nyawa ya, nye ha, si, Nka bu arum nke anēnye n'ihi unu: nēmenu nka ka anu we nēchetam. 20 Mb͕e ha risiri nri-anyasi Ọ nara kwa iko otú ahu, si, Iko a bu ọb͕ub͕a-ndu ọhu nime ọbaram, bú nke anāwusi n'ihi unu. 21 Ma le, aka onye nāraram nye diyerem n'elu table. 22 N'ihi na Nwa nke madu nāga n'ezie, dika akaworo ya: ma ahuhu gādiri nwoke ahu onye anēsite n'aka-ya rara Ya nye. 23 Ha we malite ijurita onwe-ha, onye ọ bu n'etiti ha gēme ihe a. 24 Esem-okwu we da kwa n'etiti ha, onye nime ha ka anāgu na ọ ka ibe-ya uku. 25 O we si ha, Ndi-eze nke mba ọzọ nēme ha dika ndi nwe ha; ndi nāchi kwa ha ka anākpọ ndi nālu ọlu ọma. 26 Ma unu onwe-unu agaghi-adi otú a: kama onye ka ibe-ya uku n'etiti unu, ya di ka onye bu nwata; onye bu kwa onye-isi, ya di ka onye nēje ozi. 27 N'ihi na ònye ka ibe-ya uku, onye nānọdu na nri, ma-ọbu onye nēje ozi? ọ̀ bughi onye nānọdu na nri? ma Mu onwem di n'etiti unu ka onye nēje ozi. 28 Ma unu onwe-unu bu ndi soworom n'ọnwunwam nile; 29 Mu onwem nāb͕a kwa ndu inye unu ala-eze, dika Nnam b͕ara ndu inyem, 30 ka unu we rie ṅu kwa na table nkem n'ala-ezem; unu gānọkwasi kwa n'oche-eze nēkpe ebo iri na abua nke Israel ikpé. 31 Saimon, Saimon, le, Setan riọtara unu, ka ọ yọcha unu dika ọka: 32 ma Mu onwem riọrọ aririọ bayere gi, ka okwukwe-gi ghara igwu agwu: gi-onwe-gi, mb͕e i gēchighariwori, gi me kwa ka umu-nna-gi guzosie ike. 33 O we si Ya, Onye-nwe-ayi, abum onye edoziworo iso Gi ga rue ulo-nkpọrọ ru kwa ọnwu. 34 O we si, Asim i, Pita, oke-ọkuku agaghi-akwá ta, rue mb͕e i gāgọ ub͕ò atọ, si na i mataghim. 35 O we si ha, Mb͕e M'zipuru unu nējighi àkpà-ego, na àkpà-ije, na akpukpọ-ukwu, ọ̀ di ihe kọrọ unu? Ha si, Ọ dighi ihe kọrọ ayi. 36 O we si ha, Ma ub͕u a, onye nwere àkpà-ego, ya were ya, onye nwere àkpà-ije, ya were kwa ya: ma onye nēnweghi, ya re uwe-ya, zuta mma-agha. 37 N'ihi na asim unu, na ihe a edeworo n'akwukwọ nsọ aghaghi imezu n'arum, Ọ bu kwa na ndi nēmebi iwu ka aguru Ya: n'ihi na ihe dirim nwere ọgwugwu. 38 Ha we si, Onye-nwe-ayi, le, mma-agha abua di n'ebe a. O we si ha, O zuwo. 39 O we puta, ga ugwu Olive, dika Ọ nēme mb͕e dum; ndi nēso uzọ-Ya soro kwa Ya. 40 Ma mb͕e O ruru n'ebe ahu, Ọ siri ha, Nēkpenu ekpere ka unu ghara ibà n'ọnwunwa. 41 Ewe weputa Ya onwe-ya n'etiti ha dika ebe agāturu nkume; O we b͕ue ikperè n'ala we nēkpe ekpere, 42 si, Nna, ọ buru na ọ di Gi nma, naram iko a: otú ọ di, ka eme ihe Gi onwe-gi nāchọ, ọ bughi ihe Mu onwem nāchọ. 43 Ewe me ka Ọ hu mọ-ozi nke si n'elu-igwe bia, nēnye Ya ike. 44 Ma ebe o nēb͕u Ya nb͕u n'obi ri nne Ọ kpe ekpere si-ike karia: ọsusọ-Ya we ghọ ihe dika oké ọkpurukpu ọbara nāda n'ala. 45 Mb͕e O biliri n'ekpere-Ya, O we biakute ndi nēso uzọ-Ya, Ọ hu ha ka ha nāraru ura site n'ihe-nwuta, 46 O we si ha, Gini mere unu nāraru ura? bilienu nēkpe kwa ekpere, ka unu we ghara ibà n'ọnwunwa. 47 Mb͕e Ọ kpu okwu n'ọnu, le, ìgwè madu biara; onye ahu anākpọ Judas, bú otù onye n'etiti ndi-ozi iri na abua ahu, buru kwa ha uzọ nābia; o we bia rue Jisus nso isutu Ya ọnu. 48 Ma Jisus siri ya, Judas, ì ji isutu-ọnu nārara Nwa nke madu nye? 49 Ma mb͕e ndi nọ Ya gburugburu huru ihe gādi, ha si, Onye-nwe-ayi, àyi gēwere mma-agha b͕ue? 50 Otù onye nime ha we b͕ue orù onye-isi-nchu-àjà mma, bipu nti aka-nri ya. 51 Ma Jisus zara, si, Kwenu ya rue nka. O we metu nti-ya aka, me ka aru di ya ike. 52 Jisus we si ndi-isi-nchu-àjà, na ndi-ọchi-agha nke ulo uku Chineke, na ndi-okenye, ndi biara imegide Ya, Ùnu putara chiri mma-agha na osisi, dika imegide onye nāpunara madu ihe? 53 Mb͕e Mu na unu nọ kwa-ubọchi n'ulo uku Chineke, unu esetighi aka-unu imegidem: ma nka bu oge hour unu, na ike nke ọchichiri. 54 Ha we jide Ya, duru Ya je, dubà kwa Ya n'ulo onye-isi-nchu-àjà. Ma Pita nēso n'ebe di anya. 55 Ma mb͕e ha funwuru ọku n'etiti obí, we nọdu ala n'otù, Pita we nọdu n'etiti ha. 56 Ma otù nwa-ab͕ọghọ huru ya ka ọ nọduru n'ìhè ọku ahu, o we legide ya anya, si, Nwoke a na Ya nọ-kwa-ra. 57 Ma ọ gọrọ, si, Nwanyi amataghim Ya. 58 Mb͕e nwa oge gasiri onye ọzọ we hu ya, si, Gi onwe-gi bu kwa otù onye nime ha. Ma Pita siri, Nwoke, abughim. 59 Ma mb͕e ihe dika otù oge hour gasiri onye ọzọ kwusibere ike, si, N'ezie nwoke a na Ya nọkwara: n'ihi na ọ bu kwa onye Galili. 60 Ma Pita siri, Nwoke, amataghim ihe i nēkwu. Ngwa ngwa, mb͕e ọ kpu okwu n'ọnu, oke-ọkuku we kwa ákwá. 61 Onye-nwe-ayi we chigharia, le Pita anya. Pita we cheta okwu Onye-nwe-ayi, otú Ọ siri ya, Mb͕e oke-ọkuku akākwaghi ta, i gāgọnarim ub͕ò atọ. 62 O we pua, kwa ákwá nke-uku. 63 Ndikom ndi jidere Jisus we me Ya ihe-ọchì, pia kwa Ya ihe. 64 Ha we kechi iru-Ya, jua Ya, si, Bue amuma: ònye bu onye ahu nke tiri Gi aka? 65 Ọtutu ihe ọzọ ka ha kwuru megide Ya, nēkwulu Ya. 66 Mb͕e chi bọrọ, nb͕akọ ndi-okenye nke ndi-Ju zukọrọ, ma ndi-isi-nchu-àjà ma ndi-ode-akwukwọ; ha we duru Ya ga ba na nnọkọ-ikpé-ha, si, 67 Ọ buru na Gi onwe-gi bu Kraist, gwa ayi. Ma Ọ siri ha, Ọ buru na Mu agwa unu, unu agaghi-ekwe ma-ọli: 68 ma ọ buru na Mu aju unu ajuju, unu agaghi-aza ma-ọli. 69 Ma site n'ub͕u a ka Nwa nke madu gānọdu n'aka-nri nke ike Chineke. 70 Ha nile si, Gì onwe-gi bu kwa Ọkpara Chineke? Ọ si ha, Unu onwe-unu si na Mu onwem bu Ya. 71 Ha we si, Ọ̀ bu nkpà àmà gini nākpa ayi ọzọ? n'ihi na ayi onwe-ayi nuru site n'ọnu-Ya.

Luk 23

1 Ọra ndi ahu nile we bilie, duru Ya je n'iru Pailat. 2 Ha we malite ibo Ya ebubo, si, Ayi huru Onye a, ka O nēduhie mba-ayi, nēb͕ochi ha itu ùtú nye Sisa, nāsi kwa na Ya onwe-ya bu Kraist, buru kwa Eze. 3 Pailat we jua Ya, si, Gì onwe-gi bu eze ndi-Ju? O we za ya, si, Gi onwe-gi kwuru. 4 Pailat we si ndi-isi-nchu-àjà na ìgwè madu nile, Ahughim ihe kwesiri ahuhu-nmehie n'aru Nwoke a. 5 Ma ha kwusiri ike kari, si, Ọ nākwali ndi-Ju, nēzí ihe n'ebe nile di na Judia dum, nāmalite kwa site na Galili rue ebe a. 6 Ma mb͕e Pailat nuru ya, ọ jua ma Nwoke a bu onye Galili. 7 Mb͕e ọ mazuru na O si n'ebe Herod nāchi bia, o we ziga Ya jekuru Herod, onye ya onwe-ya nọ kwa na Jerusalem na mb͕e ahu. 8 Ma mb͕e Herod huru Jisus, Ọ ṅuria ọṅu nke-uku: n'ihi na ọ nāchọ ihu Ya anya n'oge di anya gara aga, n'ihi na ọ nuru ihe bayere Ya; o we nēle anya ihu ihe-iriba-ama di aṅa Ọ gēme. 9 O we jua Ya ajuju n'ọtutu okwu; ma Ya onwe-ya azaghi ya ihe ọ bula. 10 Ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ we guzo, nēbo Ya ebubo si-ike. 11 Herod, ya na ndi-agha-ya, we me Ya ka Ọ buru ihe-efu, o me-kwa-ra Ya ihe-ọchì, we b͕okwasi Ya uwe mara nma nke-uku we zighachi Ya jekuru Pailat. 12 Herod na Pailat we me eyì n'etiti onwe-ha n'ubọchi ahu: n'ihi na n'oge gara aga ha bu ndi-iro. 13 Pailat we kpọkọ ndi-isi-nchu-àjà na ndi-isi na ndi-Ju, 14 si ha, Unu kutaram Nwoke a, dika onye nēduhie ndi-Ju: ma le, mu onwem kpere Ya ikpé n'iru unu, ma ahughim ihe ọ bula n'aru Nwoke a kwesiri ahuhu-nmehie n'ihe nile unu ji bo Ya ebubo: 15 é-è, ọbuná Herod ahugh: n'ihi na o zighachiri Ya nye ayi; le kwa, ọ dighi ihe ọ bula kwesiri ọnwu nke O meworo. 16 Ya mere, m'gādọ Ya aka na nti, we rapu Ya. 17 Ma ọ di ya nkpà irapuru ha otù onye-nkpọrọ n'ememe. 18 Ma ha nile tiri nkpu n'otù, si, Wepu Nwoke a, ma rapuru ayi Barabas: 19 onye atubàra n'ulo-nkpọrọ n'ihi otù nbili imegide ndi-isi ebiliri nime obodo ahu, ya na ib͕u-madu. 20 Pailat we gwa ha okwu ọzọ, ebe ọ nāchọ irapu Jisus; 21 ma ha tiri nkpu, si, Kpọgide Ya n'obe, kpọgide Ya n'obe. 22 O we si ha nke ub͕ò atọ, É-è, n'ìhi na Onye a mere ihe ọjọ gini? Ahughm ihe kwesiri inwu anwu n'aru Ya: ya mere m'gādọ Ya aka na nti, we rapu Ya. 23 Ma ha were oké olu rugide, nāriọ ka akpọgide Ya n'obe. Olu-ha we kari ya ike. 24 Pailat we kpebì ka eme ihe ha riọrọ. 25 O we rapuru ha onye ahu atubàrari n'ulo-nkpọrọ n'ihi nbili imegide ndi-isi na ib͕u-madu, onye ha riọrọ n'aka-ya; ma ọ rara Jisus nye ka eme Ya ihe ha chọrọ. 26 Mb͕e ha nēdupu Ya, ha we jide otù onye, bú Saimon, onye Sairini, nke si n'azu obodo ahu bia, ha we bokwasi ya obe-Ya, ka o buru ya so Jisus. 27 Oké ìgwè ndi-Ju nēso kwa Ya, ya na ìgwè ndinyom ndi nēti aka n'obi nākwa-kwa-ra Ya ákwá. 28 Ma Jisus chighariri n'ebe ha nọ, si, Umu-nwanyi Jerusalem, unu akwalaram ákwá, kama nākwaranu onwe-unu na umu-unu. 29 N'ihi na le, ubọchi nābia, mb͕e ha gāsi, Ngọzi nādiri ndinyom àgà, na afọ nke nāmughi nwa, na ara nke nāzùghi nwa. 30 Mb͕e ahu ka ha gāmalite isi ugwu, Dakwasinu ayi; na isi ugwu ntà, Kpuchienu ayi. 31 N'ihi na asi na ha nēme ihe ndia mb͕e osisi di ndu, gini ka agēme mb͕e ọ kpọrọ nku? 32 Ma ndikom abua ọzọ, ndi nālu ọlu ọjọ, ka edukwara, Ya na ha, ka eb͕ue ha. 33 Ma mb͕e ha biara n'ebe anākpọ Okpokoro-isi, n'ebe ahu ka ha kpọgidere Ya na ndi ahu nālu ọlu ọjọ n'obe, otù onye n'aka-nri-Ya na onye ọzọ n'aka-ekpe-Ya. 34 Ma Jisus siri, Nna, b͕aghara ha; n'ihi na ha amataghi ihi ha nēme. Mb͕e ha nēkè kwa uwe-Ya n'etiti onwe-ha ha fere nzà. 35 Ndi-Ju nēguzo kwa, nēkiri. Ndi-isi we me kwa Ya ihe-ọchì, si, Ọ zọputara ndi ọzọ; Ya zọputa Onwe-ya, ọ buru na Onye a bu Kraist nke Chineke, Onye Ọ rọputara. 36 Ndi-agha we me kwa Ya ihe-ọchì, nābiakute Ya, nēche kwa n'iru Ya manya-vine b͕ara uka, 37 si, Ọ buru na Gi onwe-gi bu Eze ndi-Ju, zọputa Onwe-gi. 38 Ma ihe-ndekwasi di kwa n'elu isi-Ya, ONYE A BU EZE NDI-JU. 39 Otù nime ndi ahu nālu ọlu ọjọ ndi akwubara nēkwulu kwa Ya, si, Gì onwe-gi abughi Kraist ahu? zọputa Onwe-gi na ayi. 40 Ma ibe-ya zara, we bara ya mba, si, Gì onwe-gi adighi-atu egwu ọbuná Chineke, ebe i nọ n'ọmuma-ikpé ahu? 41 N'ezi-okwu amakwara ayi ikpé ziri ezi; n'ihi na ayi nānata ihe kwesiri ihe ayi mere: ma ọ dighi ihe ọ bula Onye a mehiere. 42 O we si, Jisus, chetam mb͕e ọ bula I gābia n'ala-eze-Gi. 43 Ọ we si ya, N'ezie asim i, Ta ka Mu na gi gānọ na Paradais. 44 Ma ub͕u a ọ di ka oge hour nke-isi, ọchichiri we b͕a n'ala ahu dum rue oge hour nke-iteghete, 45 n'ihi na anyanwu nāb͕a itiri: ákwà-nb͕ochi nke ulo nsọ Chineke we b͕awa n'etiti. 46 Mb͕e Jisus tisiri nkpu n'oké olu, Ọ si, Nna, n'aka-Gi ka M'nēnye mọm idebe: mb͕e O kwusiri nka, O we kubìe ume. 47 Ma mb͕e ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise huru ihe mere, o tobe Chineke, si, N'ezi-okwu Nwoke a bu onye ezi omume. 48 Ìgwè madu nile ndi zukọrọ n'ihe-nkiri a, mb͕e ha kirisiri ihe nile mere, ha we laghachi nēti aka n'obi-ha. 49 Ndi nile ndi mara Ya nke-ọma, na ndinyom ndi soro Ya site na Galili, guzokwara n'ebe di anya, nēle ihe ndia. 50 Ma le, otù nwoke, aha-ya bu Josef, onye bu onye-nnọkọ-ikpé, ọ bu ezi nwoke buru kwa onye ezi omume, 51 (onye ahu ekweyeghi ìzù-ha na omume-ha), onye sitere n'Arimatia, otù obodo ndi-Ju, onye nēche ala-eze Chineke: 52 onye ahu jekuru Pailat, riọ aru Jisus. 53 O we budata ya, ke ya n'ezi ákwà ọcha, we tọb͕ọ Ya n'ílì nke egwuwara ya-ri na nkume, nke akātọb͕ọghi onye ọ bula nime ya. 54 Ma ọ bu ubọchi Nkwadebe, ubọchi-izu-ike nēru kwa nso. 55 Ndinyom, ndi si na Galili soro Ya bia, we so n'azu, le ílì ahu, na otú atọb͕ọrọ aru-Ya. 56 Ha we laghachi, dozie uda utọ di ichi iche na manu-otite. N'ubọchi-izu-ike ha we nọdu nwayọ dika ihe enyere n'iwu si kwu.

Luk 24

1 Ma n'ubọchi mbu nke ízù ubọchi asa, n'oké isi-ututu, ha biaruru ílì ahu, nēbute uda utọ di iche iche nke ha doziri. 2 Ha we hu nkume ahu na akpọrepuwo ya n'ílì. 3 Ha we ba nime, ma ha ahughi aru nke Onye-nwe-ayi Jisus. 4 O we rue, mb͕e ha nọ n'obi abua n'ihi nka, le, ndikom abua guzoro ha nso n'uwe nēb͕u àmùmà: 5 ma mb͕e ha nātu egwu, nērube kwa iru-ha n'ala, ha si ha, Gini mere unu nāchọ Onye di ndu n'etiti ndi nwuru anwu? 6 Ọ nọghi n'ebe a, kama emere ka O si n'ọnwu bilie: chetanu otú Ọ gwara unu okwu mb͕e Ọ nọ kwa na Galili, 7 si, na aghaghi irara Nwa nke madu nye n'aka ndikom nēmehie emehie, na aghaghi kwa ikpọgide Ya n'obe, na Ọ ghaghi kwa isi n'ọnwu bilie n'ubọchi nke-atọ. 8 Ha we cheta okwu-Ya, 9 we si n'ílì ahu laghachi, kọrọ ndi-ozi iri na otù, na ndi nile fọduru, ihe ndia nile. 10 Ma ha bu Meri Magdalini, na Joana, na Meri nne Jemes: ndinyom fọduru ndi soro ha we gwa ndi-ozi-Ya ihe ndia. 11 Okwu ndia we di ka okwu efu n'anya-ha; ha ekweghi kwa ha. 12 Ma Pita biliri, b͕a ọsọ jerue ílì; o we ruru ala, nyo nime ya, we hu ezi ákwà-ozu ahu ka ha tọb͕ọrọ nání ha; o we la n'ulo-ya, ihe nke meworo nēju kwa ya anya. 13 Ma le, ubọchi ahu ndikom abua nime ha nāga otù obodo ntà, aha-ya bu Emeus, nke di ọgu mail atọ site na Jerusalem. 14 Ndi ahu nākparita kwa n'etiti onwe-ha uka bayere ihe ndia nile mereri. 15 O we rue, mb͕e ha nākparita uka nājurita kwa onwe-ha ajuju, Jisus onwe-ya we biarue nso, so kwa ha ga. 16 Ma eb͕ochiri ha anya ka ha ghara ima Ya. 17 O we si ha, Gini bu okwu ndia unu nāgwarita onwe-unu, ka unu nāga ije? Ha we guzo nāb͕aru iru. 18 Otù onye nime ha, aha-ya bu Kleopas, we za, si Ya, Ọ̀ bu nání Gi onwe-gi nọ dika ọbìa na Jerusalem nāmaghi ihe mere nime ya n'ubọchi ndia? 19 Ọ si ha, Ihe gini? Ha si Ya, Ihe bayere Jisus Onye Nazaret, Onye bu onye-amuma di ike n'ọlu na okwu n'iru Chineke na ndi-Ju nile: 20 ya na otú ndi-isi-nchu-àjà na ndi-isi-ayi rara Ya nye ka ama Ya ikpé ọnwu, we kpọgide Ya n'obe. 21 Ma ayi onwe-ayi lere anya na Ya onwe-ya bu onye gaje ib͕aputa Israel. E, tukwasi kwa ihe ndia nile, ta bu ubọchi nke-atọ site na mb͕e ihe ndia mere. 22 Ma ndinyom ufọdu n'etiti ayi mekwara ka ibobo nwua ayi n'aru, n'ihi na ha jere ílì-Ya n'isi-ututu; 23 mb͕e ha nāhughi aru-Ya, ha we bia, si, na ha hukwarari ọhù, bú ndi-mọ-ozi, ndi siri na Ọ di ndu. 24 Ufọdu n'etiti ndi soro ayi we je ílì ahu, hu kwa ya ọbuná otú ndinyom ahu kwuru: ma Ya onwe-ya ka ha nāhughi. 25 Ya onwe-ya we si ha, Unu ndi nēnweghi uche, ndi di kwa urè n'obi ikwere n'ihe nile ndi-amuma kwuru! 26 Ọ̀ bughi na Kraist aghaghi ihu ahuhu ndia, na ibà n'ebube-Ya? 27 O we malite isi n'akwukwọ Moses, si kwa n'akwukwọ ndi-amuma nile, me ka ha mata isi okwu bayere Onwe-ya n'ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ. 28 Ha we biarue obodo ntà ahu nso, ebe ha nāga: ma Ya onwe-ya mere dika Ọ nāga n'iru. 29 Ha we rugide Ya, si, Nọyere ayi: n'ihi na o rubewo anyasi, ubọchi agamiwo kwa ub͕u a. O we ba n'ulo inọyere ha. 30 O we rue, mb͕e Ya na ha nọdusiri na nri, na O were ob͕e achicha, gọzie ya, nyawa ya, we nēnye ha. 31 Ewe saghe anya-ha, ha we mara Ya; Ya onwe-ya we funari n'anya-ha. 32 Ha we sirita onwe-ha, Òbi-ayi ekpoghi ọku nime ayi, mb͕e Ọ nāgwa ayi okwu n'uzọ, mb͕e Ọ nēmeghere ayi ihe edeworo n'akwukwọ nsọ? 33 Ha we bilie n'oge hour ahu, laghachi na Jerusalem, we hu ndi-ozi iri na otù ahu, na ndi ha na ha nọ, ka ha zukọrọ, 34 nāsi, N'ezi-okwu Onye-nwe-ayi esiwo n'ọnwu bilie, were kwa Onwe-ya gosi Saimon. 35 Ha onwe-ha we kọ ihe mere n'uzọ, na otú ha mara Ya n'inyawa ob͕e achicha ahu. 36 Ma mb͕e ha nēkwu ihe ndia, Ya onwe-ya guzoro n'etiti ha, si ha, Udo diri uno. 37 Ma ha turu ujọ, tu kwa egwu, ha we chè na ha huru mọ. 38 O we si ha, Gini mere obi nālọ unu miri? n'ìhi gini ka iru-uka nēbili kwa n'obi-unu? 39 Lenu akam na ukwum, na ọ bu Mu onwem: datunum aka, le-kwa-nu; n'ihi na mọ enweghi anu-aru na ọkpukpu, otú unu huru na Mu onwem nwere. 40 Mb͕e O kwusiri nka, O we gosi ha aka-Ya na ukwu-Ya. 41 Ma mb͕e ha nọ nēkweghi ekwe n'ihi ọṅù, mb͕e ọ nēju kwa ha anya, Ọ si ha, Ùnu nwere ihe-oriri ọ bula n'ebe a? 42 Ha we nye Ya òkè nime azù aruru aru. 43 O we nara ya, rie n'iru ha. 44 O we si ha, Ndia bu okwum nke M'gwara unu, mb͕e Mu na unu nọ-kwa-ra, na ihe nile aghaghi imezu, bú nke edeworo n'akwukwọ iwu Moses, na ndi-amuma, na abù ọma bayerem. 45 Mb͕e ahu ka O meghere uche-ha, ka ha we ghọta ihe edeworo n'akwukwọ nsọ; 46 O we si ha, Otú a ka edeworo ya n'akwukwọ nsọ, na Kraist ahu gāhu ahuhu, si kwa na ndi nwuru anwu bilie n'ubọchi nke-atọ; 47 na agēkwusa kwa nchèghari na nb͕aghara nmehie n'aha-Ya gwa mba nile, nāmalite site na Jerusalem. 48 Unu onwe-unu bu ndi-àmà nke ihe ndia. 49 Le kwa, Mu onwem nēziputa nkwà nke Nnam n'isi-unu: ma nọdunu n'obodo a, rue mb͕e agēwere ike nke si n'elu yikwasi unu. 50 O we dupu ha rue n'uzọ Betani: O we chilie aka-Ya elu, gọzie ha. 51 O we rue, mb͕e Ọ nāgọzi ha, na Ọ kewapuru n'ebe ha nọ, ewe welie Ya la n'elu-igwe. 52 Ndi ahu we kpọ isi ala nye Ya, we ji oké ọṅù laghachi na Jerusalem: 53 ha we nānọ n'ulo uku Chineke mb͕e nile, nāgọzi Chineke.

Jọn 1

1 Na mbu ka Okwu ahu diri, Okwu ahu na Chineke dikwara, Okwu ahu buru kwa Chineke. 2 Onye ahu na Chineke diri na mbu. 3 Ekère ihe nile site n'aka-Ya; ekèghi kwa otù ihe ọ bula nke ekèworo ma Ọ nọghi ya. 4 Nime Ya ka ndu diri; ndu ahu buru kwa Ìhè nke madu. 5 Ìhè ahu we nāmu n'ọchichiri; ọchichiri ahu ejideghi kwa ya. 6 Otù nwoke putara, onye ezitere site n'ebe Chineke nọ, aha-ya bu Jọn. 7 Onye ahu biara ib͕a àmà, ka o we b͕ara Ìhè ahu àmà, ka madu nile we site n'aka-ya kwere. 8 Ya onwè-ya abughi Ìhè ahu, kama ọ biara ka o we b͕ara Ìhè ahu àmà. 9 Ezi Ìhè ahu diri, Nke nēnye madu ọ bula nke nābia nime uwa ìhè. 10 Ọ nọri n'uwa, ekèkwara uwa site n'aka-Ya, uwa amaghi kwa Ya. 11 Ọ biakutere ihe nke aka Ya, ma ndi nke aka Ya akpọbataghi Ya. 12 Ma ka ha ra, bú ndi nara Ya, ha ka O nyere ike ighọ umu Chineke, bú ndi kwere n'aha-Ya: 13 ndi amuru, ọ bughi site n'ọbara, ọ bughi kwa site n'ọchichọ anu-aru, ọ bughi kwa site n'ọchichọ nwoke, kama site na Chineke. 14 Okwu ahu we ghọ anu-aru, bú madu, O we biri n'etiti ayi, (ayi kiri-kwa-ra otuto-Ya, bú otuto dika otù nwa-nwoke amuru nání ya nānata n'aka nna-ya), O juputara n'amara na ezi-okwu. 15 Jọn nāb͕ara Ya àmà, nēti kwa nkpu, si, Onye a bu Onye m'kwuru okwu bayere Ya, si, Onye ahu Nke nābia n'azum aghọwo Onye burum uzọ: n'ihi na Ọ buri Onye mbu n'ebe m'nọ. 16 N'ihi na site na njuputa-Ya ka ayi onwe-ayi nile natara, ọbuná amara nēsochi amara. 17 N'ihi na esitere n'aka Moses nye iwu Chineke; amara na ezi-okwu sitere n'aka Jisus Kraist bia. 18 Ọ dighi onye ọ bula huworo Chineke mb͕e ọ bula; Chineke, bú Ọkpara amuru nání Ya, Onye nādabere n'obì Nna-Ya, Onye ahu kọrọ Ya nye madu. 19 Nka bu kwa àmà Jọn, mb͕e ndi-Ju siri na Jerusalem zigara ya ndi-nchu-àjà na ndi Livai ka ha jua ya, si, Gì onwe-gi bu onye? 20 O we kwuputa, ọ gọghi kwa agọ; ma o kwuputara, si, Mu onwem abughi Kraist ahu. 21 Ha we jua ya, si, Ì bu gini kwa? Gì onwe-gi bu Elaija? Ọ si, Abughi m. Gì onwe-gi bu onye-amuma ahu? O we za, si, É-è. 22 Ya mere ha siri ya, Ì bu onye? ka ayi we nye ndi zitere ayi ihe-ọziza. Ì si gini bayere onwe-gi? 23 Ọ siri, Mu onwem bu olu otù onye nēti nkpu n'ọhia, si, Menu uzọ Onye-nwe-ayi ka o guzozie ike, dika Aisaia onye-amuma kwuru. 24 Ma ufọdu nime ha ka ezitereri site n'etiti ndi-Farisi. 25 Ha we jua ya, si ya, Ọ̀ bu kwa gini mere i nēme baptism, ma ọ buru na gi onwe-gi abughi Kraist ahu, ma i bughi Elaija, ma i bughi onye-amuma ahu? 26 Jọn zara ha, si, Mu onwem nēji miri me baptism: n'etiti unu ka otù Onye nēguzo Nke unu onwe-unu nāmataghi, 27 bú Onye ahu Nke nābia n'azum, Onye mu onwem nēkwesighi itọpu eriri akpukpọ-ukwu-Ya. 28 Emere ihe ndia na Betani n'ofè Jọdan, ebe Jọn nēme baptism. 29 N'echi-ya ọ hu Jisus ka Ọ nābiakute ya, o we si, Le, Nwa-aturu Chineke, Nke nēbupu nmehie nke uwa! 30 Onye a bu Onye mu onwem kwuru okwu bayere Ya, si, Otù Nwoke nābia n'azum Onye ghọworo Onye burum uzọ: n'ihi na Ọ buri Onye mbu n'ebe m'nọ. 31 Mu onwem amaghi kwa Ya; ma ka eme Ya ka Ọ puta ìhè nye Israel, n'ihi nka ka mu onwem biara nēji miri eme baptism. 32 Jọn we b͕a àmà, si, Ekiriwom Mọ Nsọ ka O si n'elu-igwe nēfeda ka nduru; O we nọgide n'aru Ya. 33 Mu onwem amaghi kwa Ya: ma Onye ziterem ka m'were miri me baptism, Onye ahu sirim, Onye ọ bula i gāhu Mọ Nsọ ka Ọ nēfedakwasi Ya, nānọgide kwa n'aru Ya, Onye ahu bu Onye nēji Mọ Nsọ eme baptism. 34 Mu onwem ahuwo kwa, b͕a kwa àmà na Onye a bu Ọkpara Chineke. 35 Ọzọ n'echi-ya Jọn guzoro, ya na madu abua nime ndi nēso uzọ-ya; 36 o we le Jisus anya ka Ọ nējeghari, ọ si, Le, Nwa-aturu Chineke! 37 Madu abua ahu ndi nēso uzọ-ya we nu ka ọ nēkwu, ha we so Jisus. 38 Jisus we chigharia, kiri ha ka ha nēso Ya, Ọ si ha, Gini ka unu nāchọ? Ha we si Ya, Rabai (nke isi-ya bu, ma asugharia ya, Onye-ozizí), òle ebe I bi? 39 Ọ si ha, Bianu, unu gāhu kwa. Ya mere ha biara hu ebe O biri; ha na Ya we nọgide ubọchi ahu; ọ di ka oge hour nke-iri. 40 Otù nime madu abua ahu ndi nuru okwu si n'ọnu Jọn puta, ndi so-kwa-ra Ya, bu Andru, nwa-nne Saimon. 41 Onye ahu buru uzọ chọta nwa-nne nke aka ya, bú Saimon, si ya, Ayi ahuwo Mesaia-ayi (nke bu, ma asugharia ya, Kraist). 42 O duru ya biakute Jisus. Jisus lere ya anya, si, Gi onwe-gi bu Saimon nwa Jọn: agākpọ gi onwe-gi Kifas (nke bu Pita, ma asugharia ya). 43 N'echi-ya Ọ chọrọ ipu ga Galili, O we hu Filip: Jisus we si ya, Som. 44 Ma Filip bu onye Betsaida, onye si n'obodo Andru na Pita puta. 45 Filip we chọta Nataniel, si ya, Ayi ahuwo Onye Moses dere ihe bayere Ya n'akwukwọ iwu, Onye ndi-amuma dekwara ihe bayere Ya, Jisus Onye Nazaret, Nwa Josef. 46 Nataniel we si ya, Ọ̀ di ezi ihe ọ bula puru isi na Nazaret puta? Filip si ya, Bia le. 47 Jisus huru Nataniel ka ọ nābiakute Ya, O we kwue okwu bayere ya, si, Le, onye Israel n'ezie, onye aghughọ nādighi ya n'aru! 48 Nataniel si Ya, Òle ebe I maram? Jisus zara, si ya, Mb͕e Filip akākpọghi gi, mb͕e i nọ n'okpuru osisi fig, ahurum gi. 49 Nataniel zara Ya, si, Rabai, Gi onwe-gi bu Ọkpara Chineke; Gi onwe-gi bu Eze Israel. 50 Jisus zara, si ya, N'ihi na M'siri gi, Ahurum i n'okpuru osisi fig, ì kwere ekwe? i gāhu ihe kariri ihe ndia uku. 51 Ọ si kwa ya, N'ezie, asim unu, Unu gāhu elu-igwe ka emegheworo ya, hu kwa ndi-mọ-ozi nke Chineke ka ha nārigo nārida kwa n'aru Nwa nke madu.

Jọn 2

1 N'ubọchi nke-atọ ọlulu-nwunye di na Kena nke Galili; nne Jisus nọ kwa n'ebe ahu: 2 ewe kpọ kwa Jisus, Ya na ndi nēso uzọ-Ya, bia n'ọlulu-nwunye ahu. 3 Mb͕e manya-vine kọrọ, nne Jisus we si Ya, Ha enweghi manya-vine. 4 Jisus we si ya, Nwanyi, gini ka Mu na gi nwekọrọ? oge hour nkem akābiarughi. 5 Nne-Ya si ndi nēje ozi, Ihe ọ bula Ọ si unu me, menu ya. 6 Ma adọbara n'ebe ahu ite nkume miri isi, dika ime-ọcha nke ndi-Ju si di, nānagide firkin abua ma-ọbu atọ n'otù. 7 Jisus si ha, Were miri b͕ajue ite-miri ndia. Ha we b͕ajupu ha n'ọnu. 8 O we si ha, Kuputanu ub͕u a, bugara onye-isi oriri. Ha we būru ya. 9 Ma mb͕e onye-isi oriri ahu deturu miri ahu ọnu nke ghọrọri manya-vine, ma ọ mataghi ebe o si puta (ma ndi nēje ozi ndi kuputarari miri ahu mara), onye-isi oriri ahu we kpọ onye nālu nwunye ọhu, 10 si ya, Onye ọ bula nēbu uzọ adọba manya-vine ọma; mb͕e ọ bula madu ṅubigasiri manya ókè o we dọba nke jọkariri njọ: gi onwe-gi edebewo manya-vine ọma rue ub͕u a. 11 Jisus mere nmalite ihe-iriba-ama-Ya nile nka na Kena nke Galili, we me ka ebube-Ya puta ìhè; ndi nēso uzọ-Ya we kwere na Ya. 12 Mb͕e ihe a gasiri Ọ ridara na Kapanaum, Ya onwe-ya, na nne-Ya, na umu-nne-Ya, na ndi nēso uzọ-Ya: ha we nọgide n'ebe ahu ọ bughi ọtutu ubọchi. 13 Ememe ngabiga nke ndi-Ju we di nso, Jisus we rigoro Jerusalem. 14 Ọ we hu n'ulo uku Chineke ndi nēre ehi na aturu na nduru, na ndi nāb͕anwe ego ka ha nọduru ala: 15 O we chiri udọ̀ me utari, we chupu ha nile n'ulo uku Chineke, ma aturu ma ehi ahu; Ọ wusì ego ndi nāb͕anwe ego, kpù kwa table-ha iru; 16 Ọ si ndi nēre nduru, Chipunu ihe ndi a n'ebe a; unu emela ulo Nnam ka ọ buru ulo ahia. 17 Ndi nēso uzọ-Ya chetara na edere ya-ri n'akwukwọ nsọ, si, Ekworo ulo-Gi gēripiam. 18 Ya mere ndi-Ju zara, si Ya, Ọ̀ bu ihe-iriba-ama gini ka I nēgosi ayi, ebe I nēme ihe ndia? 19 Jisus zara, si ha, Kwatuenu ulo nsọ a, n'ubọchi atọ M'gēweli kwa ya elu. 20 Ya mere ndi-Ju siri, Ọgu arọ abua na isi ka eji wu ulo nsọ a, Gì onwe-gi gēweli kwa ya n'ubọchi atọ? 21 Ma Ya onwe-ya nēkwu okwu bayere ulo nsọ nke bu aru-Ya. 22 Ya mere mb͕e emere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, ndi nēso uzọ-Ya chetara na O kwuru okwu a; ha we kwere ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, ya na okwu Jisus kwuru. 23 Ma mb͕e Ọ nọ na Jerusalem n'ememe ngabiga, n'ememe ahu, ọtutu madu kwere n'aha-Ya, n'ihi na ha nāhu ihe-iriba-ama-Ya nile nke Ọ nēme. 24 Ma Jisus onwe-ya araraghi Onwe-ya nye n'aka-ha na ntukwasi-obi, n'ihi na Ọ mara madu nile, 25 ya na n'ihi na ọ dighi Ya nkpà ka onye ọ bula b͕ara madu àmà; n'ihi na Ya onwe-ya mara ihe di nime madu.

Jọn 3

1 Ma otù nwoke nime ndi-Farisi di aha-ya bu Nikọdimọs, otù onye-isi nke ndi-Ju: 2 Onye ahu biakutere Ya n'abali, si Ya, Rabai, ayi matara na I bu onye-ozizí Nke siworo n'ebe Chineke nọ bia: n'ihi na ọ dighi onye ọ bula puru ime ihe-iriba-ama ndia nke Gi onwe-gi nēme, ma ọ buru na Chineke anọyeghi ya. 3 Jisus zara, si ya, N'ezie, n'ezie, asi mi, Ọ buru na amughi madu ọzọ, ọ pughi ihu ala-eze Chineke anya. 4 Nikọdimọs we si ya, Èsi aṅa pu imu madu mb͕e ọ kara nká? ọ̀ puru ibà n'afọ nne-ya nke ub͕ò abua, ewe mua ya? 5 Jisus zara, N'ezie, n'ezie, asim i, Ọ buru na amughi madu site na miri na Mọ Nsọ, ọ pughi ibà n'ala-eze Chineke. 6 Nke amuworo site n'anu-aru bu anu-aru; nke amuwo-kwa-ra site na Mọ Nsọ bu mọ. 7 Ka ọ ghara iju gi anya na M'siri gi, Aghaghi imu unu ọzọ. 8 Ifufe nēfe ebe ọ nāchọ, i nānu kwa olu-ya, ma i mataghi ebe o si bia, na ebe ọ nāga: otú a ka onye ọ bula amuworo site na Mọ Nsọ di. 9 Nikọdimọs zara, si Ya, Ìhe ndia si aṅa pu ime? 10 Jisus zara, si ya, Gì onwe-gi bu onye-ozizí Israel, ma i maghi ihe ndia? 11 N'ezie, n'ezie, asim i, Ayi nēkwu ihe ayi matara, ayi nāb͕a kwa àmà ihe ayi huru; ma unu anaraghi àmà-ayi. 12 Ọ buru na agwaram unu ihe nke uwa, ma unu ekweghi, ùnu gēsi aṅa kwere, ma ọ buru na agwam unu ihe nke elu-igwe? 13 Ọ dighi kwa onye ọ bula rigoworo n'elu-igwe, ma-ọbughi Onye siri n'elu-igwe ridata, bú Nwa nke madu. 14 Ma dika Moses weliri agwọ n'ọhia, ọbuná otú a aghaghi iweli Nwa nke madu elu: 15 ka onye ọ bula nke kwere we nwe ndu ebighi-ebi na Ya. 16 N'ihi na Chineke huru uwa n'anya otú a, na Ọ nyere ọbuná Ọkpara Ọ muru nání Ya, ka onye ọ bula nke kwere na Ya we ghara ila n'iyì, kama ka o nwe ndu ebighi-ebi. 17 N'ihi na Chineke eziteghi Ọkpara-Ya n'uwa ka O kpe uwa ikpé; kama ka ewe site n'aka-Ya zọputa uwa. 18 Ekpeghi onye kwere na Ya ikpé: ekpewo onye nēkweghi na Ya ikpé ub͕u a, n'ihi na o kweghi n'aha nke Ọkpara Chineke muru nání Ya. 19 Ma nka bu ikpé ahu, na Ìhè ahu abiawo n'uwa, ma madu huru ọchichiri n'anya kama Ìhè ahu; n'ihi na ọlu-ha jọrọ njọ. 20 N'ihi na onye ọ bula nke nēme ihe nādighi nma nākpọ Ìhè ahu asì, ọ dighi-abiakute kwa Ìhè ahu, ka aghara itu ya ọlu-ya nile n'anya. 21 Ma onye nēme ihe bu ezi-okwu nābiakute Ìhè ahu, ka ewe me ka ọlu-ya puta ìhè, na aluworo ha na Chineke. 22 Mb͕e ihe ndia gasiri Jisus na ndi nēso uzọ-Ya biara n'ala Judia; n'ebe ahu ka Ya na ha nānọgide, Ọ nēme kwa baptism. 23 Jọn nēme kwa baptism n'Inon nke di Selem nso, n'ihi na miri riri nne n'ebe ahu: ha we nābia, anēme kwa ha baptism. 24 N'ihi na akātubàghi Jọn n'ulo-nkpọrọ. 25 Ya mere iju-ajuju putara n'etiti ndi nēso uzọ Jọn na onye-Ju banyere ime-ọcha. 26 Ha we biakute Jọn, si ya, Rabai, Onye gi na Ya nọ n'ofè Jọdan, Onye gi onwe-gi b͕aworo àmà nye Ya, le, Onye ahu nēme baptism, madu nile nābiakute kwa Ya. 27 Jọn zara, si, Madu apughi inata ihe ọ bula, ọ buru na eweghi ya nye ya site n'elu-igwe. 28 Unu onwe-unu nāb͕aram àmà, na m'siri, Mu onwem abughi Kraist ahu, kama, na ezitewom n'iru Ya. 29 Onye nwere nwunye ọhu bu onye nālu nwunye ọhu: ma enyì nke onye nālu nwunye ọhu, onye nēguzo nānu kwa okwu-ya, ọ nāṅuri ọṅu nke-uku n'ihi olu onye ahu nālu nwunye ọhu: ya mere emezuwo ọṅùm a. 30 Ya onwe-ya aghaghi idi nāba uba, ma aghaghm idi nāla alà. 31 Onye si n'elu bia ka ihe nile elu: onye si n'ala puta nāputa n'ala, si kwa n'ala nēkwu okwu: Onye si n'elu-igwe bia ka ihe nile elu. 32 Ihe nke ọ huworo na nke Ọ nuru, nka ka Ọ nāb͕a àmà; ma ọ dighi onye ọ bula nānara àmà-Ya. 33 Onye nara àmà-Ya kara akàrà-ya na nka, na Chineke bu Onye ezi-okwu. 34 N'ihi na Onye ahu Chineke zitere nēkwu okwu Chineke: n'ihi na O siteghi n'ọtùtù enye Mọ Nsọ. 35 Nna nāhu Ọkpara-Ya n'anya, O nyewo kwa Ya ihe nile n'aka. 36 Onye kwere n'Ọkpara ahu nwere ndu ebighi-ebi; ma onye nēkweyeghi Ọkpara ahu agaghi-ahu ndu, kama iwe Chineke nānọgide n'aru-ya.

Jọn 4

1 Ya mere mb͕e Onye-nwe-ayi mara na ndi-Farisi nururi na Jisus nēme madu ka ha buru ndi nēso uzọ-Ya, na Ọ nēme kwa ha baptism, kari Jọn, 2 (ọ bu ezie na Jisus onwe-ya emeghi baptism, kama ọ bu ndi nēso uzọ-Ya), 3 Ọ rapuru Judia, we je Galili ọzọ. 4 Ma Ọ ghaghi igabiga n'etiti Sameria. 5 Ya mere Ọ bia rue otù obodo nke Sameria, anākpọ Saika, na nso iberibe ala ahu nke Jekob nyere nwa-ya Josef: 6 ma isi-iyi Jekob di n'ebe ahu. Ya mere Jisus, ebe ike gwuru Ya n'ije-Ya, Ọ nọduru ala otú a n'usọ isi-iyi ahu. Ọ ra ka oge hour nke-isi. 7 Otù nwanyi, bú onye Sameria, bia isere miri: Jisus si ya, Nyem miri ka M'ṅua. 8 N'ihi na ndi nēso uzọ-Ya jeriri n'obodo izu nri. 9 Ya mere nwanyi Sameria ahu si Ya, Gì onwe-gi si aṅa ariọ miri n'akam ka I ṅua, ebe I bu Onye-Ju, ma mu bu nwanyi Sameria? (N'ihi na ndi-Ju na ndi Sameria adighi-emekọ ihe. ) 10 Jisus zara, si ya, Ọ buru na i matara onyinye Chineke, na Onye Ọ bu Nke nāsi gi, Nyem miri ka M'ṅua; gi onwe-gi gāriọ Ya-ri, Ọ gēnye kwa gi miri di ndu. 11 Nwanyi ahu si Ya, Onye-nwe-ayi, I nweghi ihe isere miri, ma olùlù-miri a di omimi: òle ebe kwa ka I nwere miri ahu di ndu? 12 Ọ̀ gābu na Gi onwe-gi ka nna-ayi Jekob uku, onye nyere ayi olùlù-miri a; ya onwe-ya, na umu-ya, na anu-ulo-ya, ṅu-kwa-ra nime ya? 13 Jisus zara, si ya, Onye ọ bula nke nāṅu miri a, akpiri gākpọ ya nku ọzọ: 14 ma onye ọ bula nke gāṅu miri ahu nke Mu onwem gēnye ya, akpiri agaghi-akpọ ya nku ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi; kama miri ahu nke Mu onwem gēnye ya gāghọ nime ya isi-iyi miri nāsuputa ri nne rue ndu ebighi-ebi. 15 Nwanyi ahu si Ya, Onye-nwe-ayi, nyem miri a, ka akpiri we ghara ikpọm nku, ka m'ghara kwa isi n'ogologo uzọ a nile bia ebe a isere miri. 16 Jisus si ya, Laba, kpọ di-gi, bia kwa n'ebe a. 17 Nwanyi ahu zara, si Ya, Enweghm di. Jisus si ya, I kwuru nke-ọma, si, Enweghi m di: 18 n'ihi na i nwewo di ise; ma onye i nwere ub͕u a abughi di-gi: nka ka i kwuworo n'ezie. 19 Nwanyi ahu si Ya, Onye-nwe-ayi, ahurum na Gi onwe-gi bu onye-amuma. 20 Nna-ayi-hà nile kpọrọ isi ala nye Chineke n'ugwu a; ma unu onwe-unu si, na ebe madu aghaghi ikpọ isi ala nye Chineke di nime Jerusalem. 21 Jisus si ya, Nwanyi, kwerem, oge hour nābia, mb͕e unu nāgaghi-akpọ isi ala nye Nnam, ma ọ bu n'ugwu a, ma-ọbu na Jerusalem. 22 Unu onwe-unu nākpọ isi ala nye ihe unu nāmatagh: ayi onwe-ayi nākpọ isi ala nye ihe ayi matara: n'ihi na nzọputa si n'etiti ndi-Ju puta. 23 Ma oge hour nābia, ub͕u a ka ọ di kwa, mb͕e ndi nākpọ isi ala n'ezie gākpọ isi ala nye Nnam nime mọ na ezi-okwu: n'ihi na ndi di otú ahu ka Nnam nāchọ kwa ka ha buru ndi nākpọ isi ala nye Ya. 24 Chineke bu Mọ: ndi nākpọ kwa isi ala nye Ya aghaghi ikpọ isi ala nime mọ na ezi-okwu. 25 Nwanyi ahu si Ya, Amataram na Mesaia nābia (Onye anākpọ Kraist): mb͕e ọ bula Onye ahu gābia, Ọ gākọrọ ayi ihe nile. 26 Jisus si ya, Mu onwem Nke nāgwa gi okwu bu Ya. 27 Mb͕e Ọ nēkwu nka ndi nēso uzọ-Ya biara; o we ju ha anya na Ya na nwanyi nēkwurita okwu: otú ọ di, o nweghi onye ọ bula siri, Gini ka I nāchọ? ma-ọbu, Gini mere Gi na ya nēkwurita okwu? 28 Ya mere nwanyi ahu rapuru ite-miri-ya, we je ba nime obodo, si ndi ahu, 29 Bianu, le otù Nwoke, Onye gwaram ihe nile m'mere: Ònye a gābu Kraist ahu? 30 Ha siri n'obodo-ha puta, nābiakute kwa Ya. 31 Mb͕e ihe ndia nēme ndi nēso uzọ-Ya nāriọ Ya, si, Rabai, rie ihe. 32 Ma Ọ siri ha, Mu onwem nwere ihe-oriri iri nke unu onwe-unu nāmataghi. 33 Ya mere ndi nēso uzọ-Ya sirita onwe-ha, Ọ̀ di onye wetara Ya ihe Ọ gēri? 34 Jisus si ha, Ihe-oririm bu ka M'nēme ihe Onye ziterem nāchọ, ka M'luzu kwa ọlu-Ya. 35 Ùnu onwe-unu asighi, Ọnwa anọ fọduru, owuwe-ihe-ubi ewe bia? le, asim unu, Welienu anya-unu elu, kiri ubi, na ha chara acha ub͕u a ka ewere ihe di nime ha. 36 Onye nēwere ihe ubi nānara ugwọ-ọlu-ya, nāchikọta kwa nkpuru nye na ndu ebighi-ebi; ka onye nāgha nkpuru na onye nēwere ihe ubi we ṅuria ọṅu n'otù. 37 N'ihi na nime nka ka okwu a bu ezie, Otù onye nāgha nkpuru, ma onye ọzọ nēwere ihe ubi. 38 Mu onwem zigara unu iwere ihe ubi nke ọ dighi mb͕e unu onwe-unu dọb͕uworo onwe-unu n'ilu ya: ndi ọzọ adọb͕uwo onwe-ha n'ọlu, unu onwe-unu abàwo kwa na ndọb͕u-ha. 39 Ma ọtutu ndi Sameria si n'obodo ahu kwere na Ya n'ihi okwu nwanyi ahu, onye b͕ara àmà, si, Ọ gwaram ihe nile m'mere. 40 Ya mere mb͕e ndi Sameria biakutere Ya, ha riọ Ya ka Ọ nọyere ha: O we nọgide n'ebe ahu ubọchi abua. 41 Ma ndi kwere n'ihi okwu-Ya kariri ri nne; 42 ha we si nwanyi ahu, Ọ bughi n'ihi ihe i kwuru ka ayi nēkwe ub͕u a: n'ihi na ayi onwe-ayi anuwo, mata kwa na Onye a bu Onye-nzọputa nke uwa n'ezie. 43 Ma mb͕e ubọchi abua ahu gasiri, O si n'ebe ahu pua ba na Galili. 44 N'ihi na Jisus onwe-ya b͕ara àmà, na adighi-asọpuru onye-amuma n'ala nke aka ya. 45 Ya mere mb͕e Ọ biara na Galili, ndi Galili nara Ya nke-ọma, ebe ha hururi ka ihe O mere na Jerusalem ra n'ememe: n'ihi na ha onwe-ha je-kwa-ra ememe ahu. 46 Ya mere Ọ biaruru Kena nke Galili ozọ, ebe O mere miri ka ọ ghọ manya-vine, Ma otù nwoke nke nējere eze ozi di, nke aru nādighi nwa-ya nwoke ike na Kapanaum. 47 Mb͕e onye ahu nuru na Jisus esiwo na Judia puta ba na Galili, o jekuru Ya, riọ Ya ka Ọ ridata, me ka aru di nwa-ya ike; n'ihi na ọ nọ n'ọnu ọnwu. 48 Ya mere Jisus siri ya, Ọ buru na unu ahughi ihe-iriba-ama na ọlu-ebube, unu agaghi-ekwe ma-ọli. 49 Nwoke ahu nke nējere eze ozi si Ya, Onye-nwe-ayi, ridata mb͕e nwatakirim akānwughi. 50 Jisus si ya, Ga nke gi; nwa-gi nwoke di ndu. Nwoke ahu kwere okwu Jisus gwara ya, o we ga nke ya. 51 Ma mb͕e ọ nọ nārida ub͕u a, ndi-orù-ya zutere ya, si, na nwa-ya di ndu. 52 Ya mere ọ juru ha oge hour nke aru-ya malitere idi ya nma. Ya mere ha siri ya, Nnyahuru n'oge hour nke-asa ka aru-ọku rapuru ya. 53 Ya mere nna-ya mara na ọ bu n'oge hour ahu mb͕e Jisus siri ya, Nwa-gi nwoke di ndu: ya onwe-ya we kwere na èzí-na-ulo-ya dum. 54 Nka bu ihe-iriba-ama ọzọ nke mere ha abua nke Jisus mere, mb͕e O siri na Judia puta ba na Galili.

Jọn 5

1 Mb͕e ihe ndia gasiri otù ememe nke ndi-Ju di; Jisus we rigoro Jerusalem. 2 Ma ọdọ-miri ntà di na Jerusalem n'akuku ọnu-uzọ-ama nke aturu, nke anākpọ n'asusu Hibru Betesda, nke nwere ulo-ìbà ise. 3 Nime ndia ka ìgwè madu ndi aru-ha nādighi ike nēdina, ndi-ìsì, ndi-ngwurọ ndi akuku-aru-ha kpọnwuru akpọnwu, [nēche uṅarà nke miri ahu. 4 N'ihi na mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi nāridata n'ọdọ-miri ntà ahu n'oge ufọdu, we kpasue miri ahu: ya mere onye buru uzọ ba nime ya mb͕e akpasusiri miri ahu, eme ka aru di ya nma, n'ọria ọ bula jidere ya. ] 5 Ma otù nwoke nọ n'ebe ahu, onye nọri orú arọ na iri na asatọ na nriaria-ya. 6 Mb͕e Jisus huru onye a ka o nēdina, ebe Ọ ma-kwa-ra na ọ nọri ogologo oge n'ọnọdu ahu, Ọ si ya, Ì nāchọ ka eme ka aru di gi nma? 7 Onye ahu aru nādighi ike zara Ya, si, Onye-nwe-ayi, enweghm madu, ka ọ tubàm n'ọdọ-miri ntà nka, mb͕e ọ bula akpasuru miri: ma mb͕e mu onwem nọ nābia, onye ọzọ eburum uzọ rida. 8 Jisus si ya, Bilie, chiri ute-gi, nējeghari. 9 Ngwa ngwa ewe me ka aru di nwoke ahu nma, o we chiri ute-ya, we nējeghari. Ma ọ bu ubọchi-izu-ike n'ubọchi ahu. 10 Ya mere ndi-Ju nāsi onye ahu emere ka aru-ya di ike, Ọ bu ubọchi-izu-ike, o zighi kwa ezi n'iwu ka i chiri ute-gi. 11 Ma ọ zara ha, si, Onye mere ka aru dim nma, onye ahu sirim, Chiri ute-gi, nējeghari. 12 Ha juru ya, si, Ònye bu Madu ahu Nke siri gi, Chiri ute-gi nējeghari? 13 Ma onye ahu emere ka aru di ya ike amataghi Onye ọ bu: n'ihi na Jisus wezugarari Onwe-ya, n'ihi na ìgwè madu di n'ebe ahu. 14 Mb͕e ihe ndia gasiri Jisus chọputara ya n'ulo uku Chineke, si ya, Le, emewo ka aru di gi nma: emehiela ọzọ, ka ihe jọkariri njọ ghara ime gi. 15 Nwoke ahu jere, gwa ndi-Ju na ọ bu Jisus mereri ka aru di ya nma. 16 N'ihi nka ka ndi-Ju nēsob͕u kwa Jisus, n'ihi na Ọ nēme ihe ndia n'ubọchi-izu-ike. 17 Ma Jisus zara ha, si, Nnam nālu ọlu rue ub͕u a, Mu onwem nālu kwa ọlu. 18 Ya mere n'ihi nka ka ndi-Ju nāchọ kari uzọ ib͕u Ya, n'ihi na ọ bughi nání na Ọ nēmebi ubọchi-izu-ike, kama Ọ nākpọ kwa Chineke Nna nke aka Ya, nēme ka Ya onwe-ya na Chineke ra. 19 Ya mere Jisus zara, si ha, N'ezie, n'ezie asim unu, Ọkpara apughi ime ihe ọ bula n'Onwe-ya, ma-ọbughi ihe Ọ huru na Nna-Ya nēme: n'ihi na ihe ọ bula Ya onwe-ya nēme, ndia ka Ọkpara-Ya nēme kwa otú ahu. 20 N'ihi na Nnam nāhu Ọkpara-Ya n'anya, nēgosi kwa Ya ihe nile Ya onwe-ya nēme: oké ọlu kari ndia ka Ọ gēgosi kwa Ya, ka o we ju unu onwe-unu anya. 21 N'ihi na dika Nnam nēme ndi nwuru anwu ka ha si n'ọnwu bilie, dika Ọ nēme kwa ka ha di ndu, otú a ka Ọkpara-Ya nēme kwa ka ndi Ọ nāchọ di ndu. 22 N'ihi na Nnam adighi-ekpe kwa madu ọ bula ikpé, kama O werewo ikpé nile nye Ọkpara-Ya; 23 ka madu nile we sopuru Ọkpara ahu, dika ha nāsọpuru Nna-Ya. Onye nādighi-asọpuru Ọkpara adighi-asọpuru Nna Nke zitere Ya. 24 N'ezie, n'ezie, asim unu, Onye nānu okwum, nke nēkwere kwa Onye ziterem, o nwere ndu ebighi-ebi, ọ biaghi kwa n'ikpé, kama o sitewo n'ọnwu ba na ndu. 25 N'ezie, n'ezie, asim unu, Oge hour nābia, ub͕u a ka ọ di kwa, mb͕e ndi nwuru anwu gānu olu Ọkpara Chineke; ndi nuru gādi kwa ndu. 26 N'ihi na dika Nnam nwere ndu nime Onwe-ya, otú a ka O nye-kwa-ra Ọkpara-Ya inwe ndu nime Onwe-ya: 27 O nye-kwa-ra Ya ike ilu ọlu ikpé, n'ihi na Ọ bu Nwa nke madu. 28 Ka ihe a ghara iju unu anya: n'ihi na oge hour nābia mb͕e ndi nile di n'ílì gānu olu-Ya, 29 ha gāputa kwa; ndi mere ezi ihe gābà na nbilite-n'ọnwu nke ndu; ma ndi mere ihe nādighi nma gābà na nbilite-n'ọnwu nke ikpé. 30 Mu onwem apughi ime ihe ọ bula n'Onwem: dika M'nānu M'nēkpe: ikpem zi-kwa-ra ezi; n'ihi na etughi m ihe Mu onwem nāchọ, kama ihe Onye ziterem nāchọ. 31 Ọ buru na Mu onwem ab͕ara Onwem àmà, àmàm abughi ezie. 32 Ọ bu onye ọzọ nab͕aram àmà; amata-kwa-ram na àmà nke Ọ nāb͕aram bu ezie. 33 Unu onwe-unu ezigaworo Jọn, ọ b͕awo-kwa-ra ezi-okwu ahu àmà. 34 Ma àmà nke Mu onwem nānara esighi n'ọnu madu puta: otú ọ di, ihe ndia ka M'nēkwu, ka ewe zọputa unu. 35 Onye ahu bu oriọna ahu nke nēre ere nenwu kwa: unu onwe-unu chọ-kwa-ra ka obi tọ unu ụtọ nke-uku n'ìhè-ya nwa oge. 36 Ma àmà nke Mu onwem ji ka nke Jọn uku: n'ihi na ọlu nke Nnam nyeworom ka M'luzue ha, ọlu ahu onwe-ha nke M'nālu, nāb͕aram àmà, na Nnam ziteworom. 37 Nna nke ziterem, Ya onwe-ya ab͕awo-kwa-ram àmà. Ọ dighi mb͕e ọ bula unu nuworo olu-Ya, ọ dighi kwa mb͕e ọ bula unu huworo oyiyi-Ya. 38 Unu enweghi kwa okwu-Ya ka ọ nọgide nime unu: n'ihi na Onye Ya onwe-ya zitere, Onye ahu ka unu onwe-unu nēkweghi 39 Unu nēnyocha ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, n'ihi na unu onwe-unu nēchè na unu nēnwe ndu ebighi-ebi nime ha; ha onwe-ha bu kwa ihe nāb͕aram àmà; 40 unu achọghi kwa ibiakutem, ka unu we nwe ndu. 41 Anaraghi m otuto n'aka madu. 42 Ma amaram unu, na unu enweghi ihu-n'anya Chineke nime onwe-unu. 43 Mu onwem abiawo n'aha Nnam, ma unu anaraghm: ọ buru na onye ọzọ gābia n'aha nke aka ya, onye ahu ka unu gānara. 44 Ùnu onwe-unu si aṅa pu ikwe, ebe unu nānara otuto n'aka ibe-unu, ma otuto nke si n'aka Onye ahu Nke nání Ya bu Chineke bia unu achọghi? 45 Unu echèla na Mu onwem gēbo unu ebubo n'iru Nnam: otù onye di nēbo unu ebubo, bú Moses, onye unu onwe-unu tukwasiworo obi-unu na ya. 46 N'ihi na ọ buru na unu kwere Moses, unu gēkwem; n'ihi na ya onwe-ya dere ihe bayerem n'akwukwọ. 47 Ma ọ buru na unu ekweghi ihe onye ahu dere n'akwukwọ, ùnu gēsi aṅa kwere okwu nkem?

Jọn 6

1 Mb͕e ihe ndia gasiri Jisus jere n'ofè ọzọ nke oké osimiri Galili, nke bu osimiri Taibirias. 2 Oké ìgwè madu we so Ya, n'ihi na ha huru ihe-iriba-ama di iche iche nke Ọ nēme n'aru ndi aru-ha nādighi ike. 3 Jisus we rigo n'ugwu ahu, n'ebe ahu ka Ya na ndi nēso uzọ-Ya nọdu-kwa-ra ala. 4 Ma ngabiga, bú ememe ndi-Ju, di nso. 5 Ya mere Jisus, mb͕e O weliri anya-Ya elu, hu na oké ìgwè madu nābiakute Ya, Ọ si Filip, Òle ebe ayi gāzuta ob͕e achicha, ka ndia we rie ihe? 6 Ma nka ka O kwuru inwa ya: n'ihi na Ya onwe-ya matara ihe Ọ gāje ime. 7 Filip zara Ya, Ob͕e achicha ọgu shilling iri agaghi-ezu ha, ka madu nile n'otù we were nke-ntà nke-ntà. 8 Otù nime ndi nēso uzọ-Ya, bú Andru nwa-nne Saimon Pita, si Ya, 9 Otù nwa-okoro ntà nọ n'ebe a, onye ji ob͕e achicha barley ise, na azù abua: ma ǹdia bu gini n'etiti ọtutu madu di otú a? 10 Jisus siri, Menu ka madu ndia nọdu ala. Ma ahihia riri nne n'ebe ahu. Ya mere ndikom ahu we nọdu ala, n'ọnu-ọgugu ra ka nnù iri na nnù abua na ọgu iri. 11 Ya mere Jisus nara ob͕e achicha ise ahu, we kele, we kèsa ha nye ndi nānọdu ala; otú ahu O were azù ahu kèsa nye ha ka azù ha chọrọ ra. 12 Ma mb͕e afọ juru ha, Ọ si ndi nēso uzọ-Ya, Chikọtanu iberibe fọduru, ka ihe ọ bula ghara ila n'iyì. 13 Ya mere ha chikọtara ha, we kpoju nkata iri na abua n'iberibe sitere n'ob͕e achicha barley ise ahu, nke fọduru ndi riworori. 14 Ya mere mb͕e ndi ahu huru ihe-iriba-ama O mere, ha siri, N'ezie Onye a bu onye-amuma ahu nke nābia n'uwa. 15 Ya mere mb͕e Jisus huru na ha gaje ibia idọkpuru Ya n'ike, ka ha we me Ya eze, O wezugara Onwe-ya ọzọ n'ugwu nání Ya onwe-ya. 16 Ma mb͕e o ruru anyasi, ndi nēso uzọ-Ya ridara n'oké osimiri; 17 ha we ba n'ub͕ọ, we nāgabiga ofè oké osimiri ọzọ iga ru Kapanaum. Ọchichiri ab͕awo-kwa-ri ub͕u a, Jisus akābiakuteghi kwa ha. 18 Oké osimiri nēbili kwa, n'ihi na oké ifufe nēfe. 19 Ya mere mb͕e ha nyasiri ihe dika orú furlong na ise ma-ọbu orú na iri, ha hu Jisus ka Ọ nēje ije n'elu oké osimiri, nābiaru kwa ub͕ọ-ha nso: ha we tua egwu. 20 Ma Ọ siri ha, Ọ bu Mu onwem; unu atula egwu. 21 Ya mere ha chọrọ iwebata Ya nime ub͕ọ-ha: ngwa ngwa ub͕ọ-ha we rue ala ebe ha nāga. 22 N'echi-ya, ìgwè madu ndi guzoro n'ofè ọzọ nke oké osimiri ahu huru na ub͕ọ ntà ọzọ adighi n'ebe ahu, ma-ọbughi otù, hu kwa na Jisus esoghi ndi nēso uzọ-Ya ba n'ub͕ọ-ha, kama na nání ndi nēso uzọ-Ya jere; 23 (otú ọ di, ub͕ọ ntà di iche iche sitere na Taibirias bia rue ebe ahu nso ebe ha riri achicha ahu mb͕e Onye-nwe-ayi kelesiri ekele): 24 ya mere mb͕e ìgwè madu ahu huru na Jisus anọghi n'ebe ahu, na ndi nēso uzọ-Ya anọghi kwa, ha onwe-ha bàra n'ub͕ọ ntà, we bia Kapanaum, nāchọ Jisus. 25 Mb͕e ha chọputara Ya n'ofè oké osimiri ọzọ, ha si Ya, Rabai, òle mb͕e I biara n'ebe a? 26 Jisus zara ha, si, N'ezie, n'ezie, asi m unu, Unu nāchọm, ọ bughi n'ihi na unu huru ihe-iriba-ama kama ọ bu n'ihi na unu riri ufọdu nime ob͕e achicha ahu, afọ ju kwa unu. 27 Unu alula ọlu inata ihe-oriri nke nāla n'iyì, kama inata ihe-oriri nke nānọgide rue ndu ebighi-ebi, nke Nwa nke madu gēnye unu: n'ihi na Onye ahu ka Nna, bú Chineke, kara akàrà. 28 Ya mere ha siri Ya, Gini kwesiri ka ayi me, ka ayi we lua ọlu Chineke nile? 29 Jisus zara, si ha, Nka bu ọlu Chineke, ka unu kwere n'Onye ahu Ya onwe-ya zitere. 30 Ya mere ha siri Ya, Gini kwa ka Gi onwe-gi nēme ka ọ buru ihe-iriba-ama, ka ayi we hu, kwere kwa Gi? gini ka I nālu? 31 Nna-ayi-hà riri manna n'ọhia; dika edeworo n'akwukwọ nsọ, si, Nri nke sitere n'elu-igwe ka O nyere ha ka ha rie. 32 Ya mere Jisus siri ha, N'ezie, n'ezie, asim unu, Ọ bughi Moses nyere unu nri ahu nke sitere n'elu-igwe; kama ọ bu Nnam nēnye unu ezi nri ahu nke sitere n'elu-igwe. 33 N'ihi na nri nke Chineke bu nke ahu nke nēsi n'elu-igwe aridata, nke nēnye kwa uwa ndu. 34 Ya mere ha siri Ya, Onye-nwe-ayi, nye ayi nri a mb͕e nile. 35 Jisus siri ha, Mu onwem bu nri nēnye ndu: onye nābiakutem, agu agaghi-agu ya ma-ọli, onye nēkwere kwa na Mu akpiri agaghi-akpọ ya nku ma-ọli mb͕e ọ bula. 36 Ma asirim unu, na unu ahuwom, ma unu ekweghi. 37 Ihe nile nke Nnam nēnyem gābiakutem; onye nābiakutekwam M'gaghi-achupu ya ma-ọli. 38 N'ihi na esiwom n'elu-igwe ridata, ọ bughi ka M'nēme ihe Mu onwem nāchọ, kama ka M'nēme ihe Onye ziterem nāchọ. 39 Ma nka bu ihe Onye ziterem nāchọ, ka M'ghara itufu ihe ọ bula nime ihe nile O nyeworo m, kama ka M'me ka o si n'ọnwu bilie n'ubọchi ikpe-azu. 40 N'ihi na nka bu ihe Nnam nāchọ, ka onye ọ bula nke nēle Ọkpara-Ya anya, nke nēkwere kwa na Ya, we nwe ndu ebighi-ebi; Mu onwem gēme kwa ka o si n'ọnwu bilie n'ubọchi ikpe-azu. 41 Ya mere ndi-Ju nātamu ntamu megide Ya, n'ihi na Ọ siri, Mu onwem bu nri nke siri n'elu-igwe ridata. 42 Ha we si, Onye a, Ọ̀ bughi Jisus, Nwa Josef, Onye ayi onwe-ayi mara nna-Ya na nne-Ya? Ò si aṅa kwue ub͕u a, Esiwom n'elu-igwe ridata? 43 Jisus zara, si ha, Unu atamula n'etiti onwe-unu. 44 Ọ dighi onye ọ bula puru ibiakutem, ọ buru na Nna Nke ziterem adọghi ya: Mu onwem gēme kwa ka o si n'ọnwu bilie n'ubọchi ikpe-azu. 45 Edewo ya n'akwukwọ ndi-amuma, si, Ha nile gābu kwa ndi Chineke zíworo ihe. Onye ọ bula nke nuworo site n'ọnu Nnam, nke mutawo-kwa-ra ihe, ọ nābiakutem. 46 Ọ bughi na madu ọ bula ahuwo Nnam, ma-ọbughi Onye ahu Nke si n'ebe Chineke nọ puta, Onye ahu ahuwo Nnam. 47 N'ezie, n'ezie, asim unu, Onye nēkwere nēnwe ndu ebighi-ebi. 48 Mu onwem bu nri nke nēnye ndu. 49 Nna-unu-hà riri manna ahu n'ọhia, ha we nwua. 50 Nka bu nri nke si n'elu-igwe ridata, ka madu we rie ufọdu nime ya, ghara kwa inwu anwu. 51 Mu onwem bu nri di ndu nke siri n'elu-igwe ridata: ọ buru na madu erie ufọdu nime nri a, ọ gādi ndu rue mb͕e ebighi-ebi: ma nri nke Mu onwem gēnye kwa bu anu-arum, n'ihi ndu nke uwa. 52 Ya mere ndi-Ju nālurita uka n'etiti onwe-ha, si, Onye a, Ò si aṅa pu inye ayi anu-aru-Ya ka ayi rie? 53 Ya mere Jisus siri ha, N'ezie, n'ezie, asim unu, Ọ buru na unu erighi anu-aru nke Nwa nke madu, ọ buru kwa na unu aṅughi ọbara-Ya, unu enweghi ndu nime onwe-unu. 54 Onye nēri anu-arum, nke nāṅu kwa ọbaram, o nwere ndu ebighi-ebi; Mu onwem gēme kwa ka o si n'ọnwu bilie n'ubọchi ikpe-azu. 55 N'ihi na anu-arum bu ihe-oriri n'ezie, ọbaram bu kwa ihe-ọṅuṅu n'ezie. 56 Onye nēri anu-arum, nke nāṅu kwa ọbaram, ọ nānọgide nimem, Mu onwem kwa nime ya. 57 Dika Nna Nke di ndu ziterem, dika Mu onwem di kwa ndu n'ihi Nnam; otú a onye nērim, onye ahu gādi kwa ndu n'ihim. 58 Nka bu nri ahu nke siri n'elu-igwe ridata: ọ bughi dika nna-unu-hà riri, we nwua: onye nēri nri a gādi ndu rue mb͕e ebighi-ebi. 59 Ihe ndia ka O kwuru n'ulo-nzukọ, mb͕e O nēzí ihe na Kapanaum. 60 Ya mere ọtutu nime ndi nēso uzọ-Ya, mb͕e ha nuru okwu ahu, ha siri, Okwu a di ike; ònye puru inu ya? 61 Ma ebe Jisus mara n'Onwe-ya na ndi nēso uzọ-Ya nātamu ntamu n'ihi nka, Ọ siri ha, Ọ̀ bu nka nēme ka unu ma n'ọnyà? 62 Ùnu agaghi-amakari kwa n'ọnyà ma ọ buru na unu ahu Nwa nke madu ka Ọ nārigo n'ebe Ọ nọri na mbu? 63 Ọ bu Mọ nēme ka madu di ndu; anu-aru abaghi urù ọ bula: okwu nke Mu onwem gwaworo unu, ha bu mọ, buru kwa ndu. 64 Ma ufọdu ndi nēkweghi di n'etiti unu. N'ihi na Jisus mara site na mbu ndi ha bu ndi nēkweghi, na onye ọ bu nke gārara Ya nye. 65 O we si, Ọ bu n'ihi nka ka M'siworo unu, na ọ dighi onye ọ bula puru ibiakutem, ọ buru na enyeghi ya site n'aka Nnam. 66 Site na nka ọtutu nime ndi nēso uzọ-Ya we laghachi azu, ha esoghi kwa Ya ejeghari ọzọ. 67 Ya mere Jisus siri ndi-ozi iri na abua ahu, Ùnu onwe-unu nāchọ kwa ila? 68 Saimon Pita zara Ya, si, Onye-nwe-ayi, Ònye ka ayi gējekuru? I nwere okwu nke ndu ebighi-ebi. 69 Ọzọ, ayi onwe-ayi ekwerewo mara kwa na Gi onwe-gi bu Onye Nsọ ahu nke Chineke. 70 Jisus zara ha, si, Ọ̀ bughi Mu onwem rọputara unu, bú ndi-ozi iri na abua, ma otù onye nime unu bu nwa ekwensu? 71 Ma Ọ nēkwu ihe bayere Judas nwa Saimon Iskariot, n'ihi na onye ahu gaje irara Ya nye, buri otù onye nime ndi-ozi iri na abua ahu.

Jọn 7

1 Mb͕e ihe ndia gasiri Jisus we nējeghari na Galili: n'ihi na Ọ chọghi ijeghari na Judia, n'ihi na ndi-Ju nāchọ uzọ ib͕u Ya. 2 Ma ememe ahu nke ndi-Ju, bú ememe ulo-ikwū, di nso. 3 Ya mere umu-nne-Ya siri Ya, Si n'ebe a pua, je na Judia, ka ndi nēso uzọ-Gi we hu kwa ọlu-Gi nile nke I nālu. 4 N'ihi na ọ dighi onye ọ bula nēme ihe ọ bula na nzuzo, ma asi na ya onwe-ya nāchọ ka ọra madu mara ya. Ọ buru na I nēme ihe ndia, me Onwe-gi ka I puta ìhè nye uwa. 5 N'ihi na ọbuná umu-nne-Ya ekweghi na Ya. 6 Ya mere Jisus si ha, oge nkem akērughi; ma oge nke unu bu ihe edoziworo mb͕e nile. 7 Uwa apughi ikpọ unu asì; ma ọ nākpọ Mu onwem asì, n'ihi na Mu onwem nāb͕ara ya àmà, na ọlu-ya nile jọrọ njọ. 8 Rigonu onwe-unu n'ememe a: Mu onwem agaghi-arigoro ememe a ub͕u a; n'ihi na oge nkem akēzughi. 9 Ma mb͕e Ọ gwasiri ha okwu ndia, Ọ nānọgide na Galili. 10 Ma mb͕e umu-nne-Ya rigosiri ememe ahu, mb͕e ahu Ya onwe-ya rigo-kwa-ra, ọ bughi n'iru ọra madu, kama dika ọ bu na nzuzo. 11 Ya mere ndi-Ju nāchọ Ya n'ememe, nāsi, Òle ebe Onye ahu nọ? 12 Oké ntamu di kwa n'etiti ìgwè madu nile bayere Ya: ufọdu nāsi, Ọ bu ezi madu; ndi ọzọ nāsi, É-è, kama Ọ nēduhie ìgwè madu a. 13 Otú ọ di, ọ dighi onye ọ bula nēkwuwa okwu bayere Ya n'ihi egwu ndi-Ju. 14 Ma mb͕e o ruru n'etiti ememe ahu ub͕u a Jisus rigoro n'ulo uku Chineke, we nēzí ihe. 15 Ya mere o nēju ndi-Ju anya, ha si, Onye a, Ò si aṅa mata akwukwọ ri nne, n'ebe ọ dighi mb͕e Ọ muworo akwukwọ? 16 Ya mere Jisus zara ha, si, Ozizím abughi nkem, kama ọ bu nke Onye ziterem. 17 Ọ buru na onye ọ bula achọ ime ihe Ọ nāchọ, ọ gāmara ihe ozizí a bu, ma o sitere n'aka Chineke, ma-ọbu na Mu onwem nēkwu site n'Onwem. 18 Onye nēkwu site n'onwe-ya nāchọ otuto nke aka ya: ma onye nāchọ otuto nke onye zitere ya, onye ahu bu onye ezi-okwu, ajọ omume adighi kwa nime ya. 19 Ọ̀ bughi Moses nyere unu iwu-unu, ma ọ dighi onye ọ bula nime unu nēme iwu ahu? Gini mere unu nāchọ uzọ ib͕um? 20 Ìgwè madu ahu zara, si, I nwere mọ ọjọ: ònye nāchọ uzọ ib͕u Gi? 21 Jisus zara, si ha, Otù ọlu ka M'luru, o we nēju unu nile anya. 22 Ọ bu n'ihi nka ka Moses nyere unu ibì-úgwù (ọ bughi na o sitere n'aka Moses, kama o sitere n'aka nna-ayi-hà); n'ubọchi-izu-ike unu nēbì kwa madu úgwù. 23 Ọ buru na ebì madu úgwù n'ubọchi-izu-ike, ka ewe ghara imebi iwu Moses; ùnu nwere òlùlù ọjọ n'arum, n'ihi na emerem ka aru dichasia otù madu nma n'ubọchi-izu-ike? 24 Unu elela iru kpe ikpé, kama nēkpenu ikpé ziri ezi. 25 Ya mere ufọdu nime ndi Jerusalem siri, Onye a, Ọ̀ bughi Onye ha nāchọ uzọ ib͕u? 26 Ma le, Ọ nēkwuwa okwu, ma ha agwaghi Ya okwu ọ bula. Ọ̀ gābu na ndi-isi mara n'ezie na Onye a bu Kraist-ayi? 27 Otú ọ di ayi matara Onye a ebe O si puta: ma mb͕e ọ bula Kraist-ayi gābia, ọ dighi onye ọ bula mara ebe O si puta. 28 Ya mere Jisus tiri nkpu n'ulo uku Chineke, nēzí ihe, nāsi kwa, Unu mataram, mata kwa ebe M'si puta; ọ bughi kwa n'Onwem ka M'biaworo, kama Onye ziterem bu ezi Onye, Nke unu onwe-unu nāmataghi. 29 Mu onwem matara Ya; n'ihi na esim n'ebe Ọ nọ bia, Ya onwe-ya zite-kwa-ram. 30 Ya mere ha chọrọ uzọ ijide Ya: ọ dighi kwa onye ọ bula tukwasiri Ya aka, n'ihi na oge hour Ya akābiaghi. 31 Ma n'etiti ìgwè madu ahu ọtutu kwere na Ya; ha nāsi kwa, Mb͕e ọ bula Kraist-ayi gābia, Ọ̀ gēme ihe-iriba-ama kari nke Onye a mere? 32 Ndi-Farisi nuru ìgwè madu ahu ka ha nātamu ntamu ndia bayere Ya; ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi we ziga ndi nējere ha ozi ka ha jide Ya. 33 Ya mere Jisus siri, Ọ fọduru nwa oge Mu na unu gānọ, M'we lakuru Onye ziterem. 34 Unu gāchọm, ma unu agaghi-achọtam: ebe Mu onwem nọ kwa, unu onwe-unu apughi ibia. 35 Ya mere ndi-Ju siritara onwe-ha, Òle ebe Onye a gaje iga na ayi onwe-ayi agaghi-achọta Ya? Ọ̀ gaje igakuru ndi b͕asara n'etiti ndi-Grik na izí ndi-Grik ihe? 36 Gini bu okwu a nke O kwuru, si, Unu gāchọm, ma unu agaghi-achọtam: ebe Mu onwem nọ kwa, unu onwe-unu apughi ibia? 37 Ma n'ubọchi ikpe-azu, bú oké ubọchi nke ememe ahu, Jisus guzoro, we tie nkpu, si, Ọ buru na akpiri kpọrọ madu ọ bula nku, ya biakutem, ṅua miri. 38 Onye nēkwere na Mu, dika ihe edeworo n'akwukwọ nsọ kwuru, n'afọ-ya ka osimiri nke miri di ndu gēsi nērùputa. 39 Ma nka ka O kwuru bayere Mọ Nsọ, Nke ndi kwere na Ya gaje inara: n'ihi na akēnyeghi Mọ Nsọ; n'ihi na akēnyeghi Jisus otuto. 40 Ya mere ufọdu nime ìgwè madu ahu, mb͕e ha nuru okwu ndia, ha si, N'ezie Onye a bu onye-amuma ahu. 41 Ndi ọzọ nāsi, Onye a bu Kraist-ayi. Ma ufọdu nāsi, Gini, ọ̀ gābu na Galili ka Kraist-ayi si bia? 42 Àkwukwọ nsọ ekwughi na Kraist-ayi nēsi na nkpuru Devid bia, site kwa na Betlehem, bú obodo ntá ebe Devid nọri? 43 Ya mere nkewa putara n'etiti ìgwè madu ahu n'ihi Ya. 44 Ma ufọdu nime ha chọrọ ijide Ya; ma ọ dighi onye ọ bula tukwasiri Ya aka. 45 Ya mere ndi ahu ndi nēje ozi biakutere ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi; ndi ahu we si ha, N'ìhi gini ka unu nēkutaghi Ya? 46 Ndi ahu ndi nēje ozi zara, si, Ọ dighi mb͕e ọ bula madu kwuru okwu di otú a. 47 Ya mere ndi-Farisi zara ha, si, Èduhiewo kwa unu onwe-unu? 48 Ọ̀ di onye ọ bula n'etiti ndi-isi, ma-ọbu n'etiti ndi-Farisi, kwere na Ya? 49 Ma ìgwè madu a nke nāmaghi iwu-ayi bu ndi anābu ọnu. 50 Nikọdimọs si ha (onye biakutere Ya na mbu, ebe ọ bu otù onye nime ha), 51 Ìwu-ayi nēkpe madu ikpé, ọ buru na o bughi uzọ nu n'ọnu-ya, we mara ihe ọ nēme? 52 Ha zara, si ya, Gì onwe-gi si kwa na Galili puta? Nyocha n'akwukwọ nsọ, le kwa na ọ dighi onye-amuma si na Galili bilie. 53 Ha nile we la, onye ọ bula n'ulo nke aka ya:

Jọn 8

1 ma Jisus gara ugwu Olive. 2 O we bia kwa ọzọ n'isi-ututu n'ulo uku Chineke, ndi-Ju nile we biakute Ya; O we nọdu ala, we nēzí ha ihe. 3 Ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi we kuta otù nwanyi nke ejidereri n'ikwa-iko; mb͕e ha guzosiri ya n'etiti, 4 ha we si Ya, Onye-ozizí, ejidewo nwanyi a n'ikwa-iko, mb͕e ọ nēme ihe ahu. 5 Ma n'iwu-ayi Moses nyere ayi iwu itu ndinyom di otú a nkume: gini kwa ka Gi onwe-gi nēkwu bayere ya? 6 Ma nka ka ha nēkwu inwa Ya, ka ha we nwe ihe ha gēji bo Ya ebubo. Ma Jisus ruru ala, were nkpisi-aka-Ya nēde ihe n'ala. 7 Ma mb͕e ha nọgidere nāju Ya, O welie Onwe-ya elu, si ha, Onye akēmehieghi n'etiti unu, ya buru uzọ tu ya nkume. 8 O we ruru kwa ala ọzọ, were nkpisi-aka-Ya nēde ihe n'ala. 9 Ma mb͕e ha nuru ya ha pua n'otù n'otù, malite na ndi bu okenye, rue ndi-ikpe-azu: ewe rapu nání Jisus, Ya na nwanyi ahu, ebe o guzoro, n'etiti. 10 Jisus we welie Onwe-ya elu, si ya, Nwanyi, òle ebe ha nọ? ọ̀ dighi onye ọ bula mara gi ikpé? 11 O we si, Ọ dighi onye ọ bula, Onye-nwe-ayi. Jisus we si, Mu onwem amaghi kwa gi ikpé: ga nke gi. site n'ub͕u a adila nēmehie ọzọ. 12 Ya mere Jisus gwara ha okwu ọzọ, si, Mu onwem bu Ìhè nke uwa: onye nēsom agaghi-ejeghari n'ọchichiri, kama ọ gēnwe Ìhè nke ndu. 13 Ya mere ndi-Farisi siri Ya, Gi onwe-gi nāb͕ara Onwe-gi àmà; àmà nke Gi abughi ezie. 14 Jisus zara, si ha, Asi kwa na Mu onwem b͕ara Onwem àmà, àmà nkem bu ezie; n'ihi na amataram ebe M'siri bia, na ebe M'nāla; ma unu onwe-unu amataghi ebe M'si bia, ma-ọbu ebe M'nāla. 15 Unu onwe-unu nēkpe dika anu-aru si di; Mu onwem ekpeghi onye ọ bula. 16 Ma ọ buru na mu onwem ekpe kwa ikpé, ikpém bu ezie; n'ihi na ọ bughi nání Mu nọ, kama ọ bu Mu onwem na Nna Nke ziterem. 17 Ma edewo kwa n'akwukwọ iwu-unu, na àmà nke madu abua bu ezie. 18 Mu onwem bu onye nāb͕ara Onwem àmà, Nna Nke ziterem nāb͕a-kwa-ram àmà. 19 Ya mere ha si Ya, Òle ebe Nna-Gi di? Jisus zara, si, Unu amataghi m, unu amataghi kwa Nnam: ọ buru na unu mataram, unu gāmata-kwa-ri Nnam. 20 Okwu ndia ka O kwuru n'ebe anēdebe ùtú anātu, mb͕e Ọ nēzí ihe n'ulo uku Chineke: ọ dighi kwa onye ọ bula jidere Ya; n'ihi na oge hour Ya akābiarughi. 21 Ya mere Ọ siri ha ọzọ, Mu onwem nāla, unu gāchọkwam, unu gānwu kwa na nmehie-unu: ebe Mu onwem nāla, unu onwe-unu apughi ibia. 22 Ya mere ndi-Ju nāsi, Ò gēb͕u Onwe-ya, na Ọ nāsi, Ebe Mu onwem nāla, unu onwe-unu apughi ibia? 23 O we si ha, Unu onwe-unu si n'ebe di ala puta; Mu onwem si n'ebe di elu puta: unu onwe-unu si n'uwa nka puta; Mu onwem esighi n'uwa nka puta. 24 Ya mere M'siri unu, na unu gānwu na nmehie nile unu: n'ihi na ọ buru na unu ekweghi na Mu onwem bu Ya, unu gānwu na nmehie nile unu. 25 Ya mere ha nāsi Ya, Gì onwe-gi bu onye? Jisus siri ha, Ọbuná ihe M'nāgwa kwa unu site na mbu. 26 Enwerem ọtutu ihe M'gēkwu nke M'gēkpe kwa bayere unu: ma Onye ziterem bu ezie; ihe Mu onwem nu-kwa-ra n'ọnu Ya, ihe ndia ka M'nāgwa uwa. 27 Ha amaghi na Ọ nāgwa ha okwu bayere Nna-Ya. 28 Ya mere Jisus siri, Mb͕e ọ bula unu gēweliwori Nwa nke madu elu, mb͕e ahu ka unu gāmara na Mu onwem bu Ya, na ọ dighi kwa ihe M'nēme n'Onwem, kama dika Nnam zírim, otú a ka m'nēkwu ihe ndia. 29 Mu na Onye ziterem nọ kwa; Ọ rapughi nání Mu; n'ihi na Mu onwem nēme ihe nātọ Ya utọ mb͕e nile. 30 Mb͕e Ọ nēkwu okwu ndia, ọtutu madu kwere na Ya. 31 Ya mere Jisus nāsi ndi-Ju ndi kwere-Ya-ri, Ọ buru na unu onwe-unu anọgide n'okwum, unu bu ndi nēso uzọm n'ezie; 32 unu gāmara kwa ezi-okwu, ezi-okwu ahu gēme kwa ka unu pua n'orù. 33 Ha zara Ya, si, Ayi bu nkpuru Abraham, ọ kādighi kwa mb͕e ọ bula ayi bu orù onye ọ bula: Gì onwe-gi si aṅa kwu, Agēme ka unu pua n'orù? 34 Jisus zara ha, si, N'ezie, n'ezie, asim unu, Onye ọ bula nke nēmehie bu orù nmehie. 35 Ma orù adighi-anọgide n'ulo rue mb͕e ebighi-ebi: nwa nānọgide ebighi-ebi. 36 Ya mere ọ buru na Ọkpara gēme ka unu pua n'orù, unu gābu ndi puworo n'orù n'ezie. 37 Amataram na unu bu nkpuru Abraham; ma unu nāchọ uzọ ib͕um, n'ihi na okwum enweghi ọnọdu nime unu. 38 Anamekwu ihe Mu onwem huworo n'ebe Nnam nọ: ya mere unu onwe-unu nēme kwa ihe unu nuru n'ọnu nna-unu. 39 Ha zara, si Ya, Nna-ayi bu Abraham. Jisus si ha, Ọ buru na unu bu umu Abraham, unu gālu ọlu Abraham. 40 Ma ub͕u a unu nāchọ uzọ ib͕um, bú Madu Nke gwaworo unu ezi-okwu, nke M'nuru n'ọnu Chineke: nka ka Abraham nēmeghi. 41 Unu onwe-unu nālu ọlu nna-unu. Ha siri Ya, Amughi ayi onwe-ayi site n'ikwa-iko otù Nna ka ayi nwere, bú Chineke. 42 Jisus siri ha, Ọ buru na Chineke bu Nna-unu, unu gāhum n'anya: n'ihi na Mu onwem siri n'ebe Chineke nọ puta we bia; n'ihi na abiaghm n'Onwem, kama Ya onwe-ya ziterem. 43 N'ìhi gini ka unu nāmaghi ihe M'nēkwu? Ọ bu n'ihi na unu apughi inu okwum. 44 Unu onwe-unu sitere na nna-unu, bú ekwensu, ọ bu kwa ihe nāgu nna-unu ka unu nāchọ ime. Onye ahu bu ob͕u-madu site na mbu, o guzoghi kwa n'ezi-okwu, n'ihi na ezi-okwu adighi nime ya. Mb͕e ọ bula ọ nēkwu okwu-ugha, ọ nēkwu ihe si n'ihe nke aka ya puta: n'ihi na ọ bu onye-ugha, buru kwa nna-ya. 45 Ma n'ihi na Mu onwem nēkwu ezi-okwu, unu ekweghm. 46 Ònye nime unu turum nmehie n'anya? Ọ buru na M'nēkwu ezi-okwu, n'ìhi gini ka unu onwe-unu nēkweghm? 47 Onye sitere na Chineke nānu okwu Chineke: n'ihi nka ka unu onwe-unu nānughi ha, n'ihi na unu esiteghi na Chineke. 48 Ndi-Ju zara, si Ya, Àyi onwe-ayi ekwughi nke-ọma, si na Gi onwe-Gi bu Onye Sameria, I nwe-kwa-ra mọ ọjọ? 49 Jisus zara, si, Mu onwem enweghi mọ ọjọ; kama anamasọpuru Nnam, unu onwe-unu nēmekwam ihe-ihere. 50 Ma Mu onwem achọghi otuto nkem: otù Onye di Nke nāchọ nēkpe kwa ikpé. 51 N'ezie, n'ezie, asim unu, Ọ buru na onye ọ bula edebe okwum, ọ gaghi-ahu ọnwu ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi. 52 Ndi-Ju siri Ya, Ub͕u a ka ayi mara na I nwere mọ ọjọ. Abraham nwuru, na ndi-amuma; ma Gi onwe-gi nāsi, Ọ buru na onye ọ bula edebe okwum, ọ gaghi-edetu ọnwu ire ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi. 53 Ọ̀ gābu na Gi onwe-gi ka nna-ayi Abraham uku, onye nwuru anwu? ndi-amuma nwu-kwa-ra: ònye ka I nēme Onwe-gi? 54 Jisus zara, si, Ọ buru na Mu onwem enye Onwem otuto, otuto nkem bu ihe-efu: Nnam bu Onye nēnyem otuto; Onye unu onwe-unu nāsi, na Ọ bu Chineke-unu; 55 unu amaghi kwa Ya; ma Mu onwem matara Ya; ọ buru kwa na agamasi, Amataghm Ya, M'gēyi unu, buru onye-ugha: ma amataram Ya, nēdebe kwa okwu-Ya. 56 Obi tọrọ nna-unu Abraham utọ nke-uku ihu ub͕ọchim; o we hu ya, ṅuri kwa ọṅu. 57 Ya mere ndi-Ju siri Ya, I kāb͕aghi ọgu arọ abua na iri, Ì huwo kwa Abraham? 58 Jisus siri ha, N'ezie, n'ezie, asim unu, Mb͕e akāmughi Abraham Mu onwem di. 59 Ya mere ha tuturu nkume itu Ya: ma Jisus zobere Onwe-ya, we si n'ulo uku Chineke pua.

Jọn 9

1 Mb͕e Ọ nāgabiga, Ọ hu otù nwoke nke kpuru ìsì site n'ọmumu-ya. 2 Ndi nēso uzọ-Ya we jua Ya, si, Rabai, ònye mehiere, onye a, ma-ọbu ndi muru ya, nke mere ka amua ya n'ìsì? 3 Jisus zara, si, Onye a emehieghi, ndi muru ya emehieghi kwa: kama ka ọlu Chineke we puta ìhè n'aru ya. 4 Ayi aghaghi ilu ọlu Onye ziterem, mb͕e ubọchi fọduru: abali nābia, mb͕e ọ dighi onye ọ bula puru ilu ọlu. 5 Mb͕e ọ bula M'nọ n'uwa, abum Ìhè nke uwa. 6 Mb͕e O kwusiri ihe ndia, Ọ bua ọnu-miri n'ala, were ọnu-miri ahu gwọ ájá, were ájá ahu te n'anya-ya abua, 7 si ya, Je sa miri n'ọdọ-miri ntà nke Sailoam (nke bu, ma asugharia ya, Onye eziteworo). Ya mere O jere, sa miri, bia kwa nāhu uzọ. 8 Ya mere ndi-ab͕ata-obi-ya, na ndi nāhu ya-ri n'oge gara aga, na ọ bu onye-aririọ, ha nāsi, Onye a, ọ̀ bughi onye nānọ ala nāriọ kwa aririọ? 9 Ndi ọzọ nāsi, Ọ bu ya; ndi ọzọ nāsi, É-è, kama o yiri ya. Ya onwe-ya siri, Mu onwem bu ya. 10 Ya mere ha nāsi ya, Èsi kwa aṅa meghe anya-gi? 11 Onye ahu zara, si, Nwoke ahu anākpọ Jisus gwọrọ ájá, te kwa ya n'anyam abua, sim, Je Sailoam, sa miri: ya mere ejerem, sa miri, ewe me ka M'hu uzọ. 12 Ha si ya, Òle ebe Onye ahu nọ? Ọ si, Amataghm. 13 Ha kutara ndi-Farisi onye ahu nke kpuru ìsì n'oge gara aga. 14 Ma ọ bu ubọchi-izu-ike n'ubọchi Jisus gwọrọ ájá, we meghe anya-ya. 15 Ya mere ndi-Farisi ju-kwa-ra ya ọzọ otú emere ọ hu uzọ. Ọ si ha, Ọ tukwasiri ájá n'anyam abua, m'we sa miri, nāhu kwa uzọ. 16 Ya mere ufọdu n'etiti ndi-Farisi nāsi, Nwoke a esiteghi n'ebe Chineke nọ, n'ihi na O dighi-edebe ubọchi-izu-ike. Ma ndi ọzọ nāsi, Nwòke bu onye-nmehie si aṅa pu ime ihe-iriba-ama di otú a? Nkewa we di n'etiti ha. 17 Ya mere ha si onye-ìsì ahu ọzọ, Gini ka gi onwe-gi nēkwu bayere Ya, n'ihi na O meghere anya-gi? Ọ si, Ọ bu onye-amuma. 18 Ya mere ndi-Ju ekweghi okwu bayere ya, na o kpururi ìsì, na eme-kwa-ra ya ka ọ hu uzọ, rue mb͕e ha kpọrọ ndi muru onye ahu emere ka ọ hu uzọ, 19 we jua ha, si, Onye a, ọ̀ bu nwa-unu, onye unu nāsi na amuru ya n'ìsì? ò si kwa aṅa hu uzọ ub͕u a? 20 Ndi muru ya zara, si, Ayi matara na onye a bu nwa-ayi, na amu-kwa-ra ya n'ìsì: 21 ma otú ọ nāhu uzọ ub͕u a, ayi amataghi; ma-ọbu onye meghere anya-ya, ayi onwe-ayi amatagh: juana ya; o ruwo dìnkpà; ya onwe-ya gēkwuru onwe-ya. 22 Ihe ndia ka ndi muru ya kwuru, n'ihi na ha nātu egwu ndi-Ju: n'ihi na ndi-Ju kwekọrọri n'etiti onwe-ha ub͕u a, ka esi n'ulo-nzukọ chupu onye ọ bula, ma ọ buru na ọ gēkwuputa na Ọ bu Kraist. 23 N'ihi nka ndi muru ya siri, O ruwo dìnkpà; juana ya. 24 Ya mere ha kpọrọ onye ahu nke ub͕ò abua, bú onye kpururi ìsì, we si ya, Nye Chineke otuto: ayi onwe-ayi matara na Nwoke a bu onye-nmhie. 25 Ya mere onye ahu zara, si, Ma Ọ bu onye-nmehie, amataghm: otù ihe ka m'matara, na, ebe m'kpururi ìsì, ub͕u a anamahu uzọ. 26 ya mere ha siri ya, Gini ka O mere gi? Ò si aṅa meghe anya-gi? 27 Ọ zara ha, si, Agwaram unu ọbuná ub͕u a, ma unu anugh: gini mere unu nāchọ inu ya ọzọ? ùnu onwe-unu nāchọ kwa ighọ ndi nēso uzọ-Ya? 28 Ha we kwutọ ya, si, Gi onwe-gi bu onye nēso uzọ Onye ahu; ma ayi onwe-ayi bu ndi nēso uzọ Moses. 29 Ayi onwe-ayi matara na Chineke agwawo Moses okwu: ma Onye a, ayi amataghi ebe O si puta. 30 Nwoke ahu zara, si ha, Ekwula, n'ihi na ihe-ebube di na nka, na unu onwe-unu amataghi ebe O si puta, ma Ọ meghere anyam. 31 Ayi matara na Chineke adighi-anu olu ndi-nmehie: kama ọ buru na onye ọ bula bu onye nēbi isi ala nye Chineke, nēme kwa ihe Ọ nāchọ, onye ahu ka Ọ nānu. 32 Site na nmalite oge a ọ dighi mb͕e anuru na onye ọ bula meghere anya onye amuru n'ìsì. 33 Ọ buru na Onye a esiteghi n'ebe Chineke nọ, Ọ pughi ime ihe ọ bula. 34 Ha zara, si ya, Amuru gi onwe-gi nime nmehie, ọ̀ bu gi onwe-gi nēzí kwa ayi ihe? Ha we chupu ya n'èzí. 35 Jisus nuru na ha chupuru ya-ri n'èzí; O we chọta ya, si, Gì onwe-gi kwere n'Ọkpara Chineke? 36 Onye ahu zara, si, Ọ̀ bu kwa onye, Onye-nwe-ayi, ka m'we kwere na Ya? 37 Jisus siri ya, I huwo Ya, Onye gi na Ya nēkwu okwu bu kwa Onye ahu. 38 O we si, Onye-nwe-ayi, ekwem. O we kpọ isi ala nye Ya. 39 Jisus we si, Ọ bu ikpé ka Mu onwem ji bia n'uwa nka, ka ndi nāhughi uzọ we hu; ka ndi huru uzọ we ghọ kwa ndi-ìsì. 40 Ndi di n'etiti ndi-Farisi ndi ha na Ya nọ nuru ihe ndia, ha we si Ya, Àyi onwe-ayi kpu-kwa-ra? 41 Jisus siri ha, Ọ buru na unu kpuru ìsì, unu agaghi-enwe nmehie: ma ub͕u a unu nāsi, Ayi nāhu uzọ: nmehie-unu nānọgide.

Jọn 10

1 N'ezie, n'ezie, asim unu, Onye nēsiteghi n'ọnu-uzọ ba n'ogige aturu, kama o si n'ebe ọzọ nārigo ibà, onye ahu bu onye-ori na onye nāpunara madu ihe. 2 Ma onye si n'ọnu-uzọ ba bu onye nāzù aturu. 3 Onye ahu ka onye-ọnu-uzọ nēmeghere uzọ; aturu nānu kwa olu-ya: ọ nākpọ kwa aturu nke aka ya n'aha, n'edupu kwa ha. 4 Mb͕e ọ bula ọ chupuru aturu nke aka ya nile, ọ nāga n'iru ha, aturu ahu nēso kwa ya: n'ihi na ha matara olu-ya. 5 Ma ha agaghi-eso ọbìa ma-ọli, kama ha gāb͕anari ya: n'ihi na ha amataghi olu ndi-ọbìa. 6 Ilu a ka Jisus turu ha: ma ha amaghi ihe ha bu, bú okwu Ọ nāgwa ha. 7 Ya mere Jisus siri ha ọzọ, N'ezie, n'ezie, asim unu, Mu onwem bu ọnu-uzọ nke aturu. 8 Ka ha ra, bú ndi nile burum uzọ bia, ha bu ndi-ori na ndi nāpunara madu ihe: ma aturu ahu anughi olu-ha. 9 Mu onwem bu ọnu-uzọ ahu: ọ buru na onye ọ bula esi na Mu ba, agāzọputa ya, ọ ganābata kwa nāpu kwa, nāhu kwa nri ọ gāta. 10 Onye-ori adighi-abia, ma-ọbughi ka o we zue ori, b͕u kwa, la kwa ihe n'iyì: Mu onwem biara ka ha we nwe ndu, ka ha nwebiga kwa ya ókè. 11 Mu onwem bu onye-ọzùzù-aturu ọma: onye-ọzùzù-aturu ọma nātọb͕ọ ndu-ya n'ihi aturu-ya. 12 Onye-ọlu egoro ego, nke nābughi kwa onye-ọzùzù-aturu, onye aturu nābughi nke aka ya, ọ nāhu agu ka ọ nābia, o we rapu aturu, b͕alaga, agu we nwude ha, chusa kwa ha: 13 n'ihi na ọ bu onye-ọlu egoro ego, ọ kpọghi kwa aturu ahu ihe. 14 Mu onwem bu onye-ọzùzù-aturu ọma; ama-kwa-ram aturu nkem, aturu nkem ma-kwa-ram, 15 dika Nnam maram, dika Mu onwem ma-kwa-ra Nnam; anamatọb͕ọ kwa ndum n'ihi aturum. 16 Aturu ọzọ ka M'nwe-kwa-ra, ndi nēsiteghi n'ogige-aturu nka: aghaghim iduta kwa ndi ahu, ha gānu kwa olum; otù ìgwè-aturu gādi kwa, otù Onye-ọzùzù-aturu. 17 N'ihi nka ka Nnam nāhum n'anya, n'ihi na Mu onwem nātọb͕ọ ndum, ka M'we nara ya ọzọ. 18 Ọ dighi onye ọ bula nānapum ya, kama Mu onwem nātọb͕ọ ya n'Onwem. Enwerem ike itọb͕ọ ya, enwe-kwa-ram ike inara ya ọzọ. Ihe a enyere n'iwu ka M'natara n'aka Nnam. 19 Nkewa putara ọzọ n'etiti ndi-Ju n'ihi okwu ndia. 20 Ọtutu nime ha we si, O nwere mọ ọjọ, anya adighi kwa Ya nma; gini mere unu nānu olu-Ya? 21 Ndi ọzọ nāsi, Ndia abughi okwu onye mọ ọjọ ji. Mọ̀ ọjọ puru imeghe anya ndi kpuru ìsì? 22 Ma ememe icheta owuwu ulo uku Chineke ọhu ruru na Jerusalem: ọ bu mb͕e oyi; 23 Jisus we nējeghari n'ulo uku Chineke n'ìbà Solomon. 24 Ya mere ndi-Ju nọgidere Ya buruburu, we si Ya, Ì nākwuba nkpuru-obi-ayi n'elu rue ole mb͕e? Ọ buru na Gi onwe-gi bu Kraist-ayi, gwawa ayi. 25 Jisus zara ha, si, Agwaram unu, ma unu adighi-ekwe: ọlu nke Mu onwem nālu n'aha Nnam, ndia nāb͕aram àmà. 26 Ma unu onwe-unu adighi-ekwe, n'ihi na unu adighi nime aturu nkem. 27 Aturu nkem nānu olum, Mu onwem ma-kwa-ra ha, ha nēsokwam: 28 Mu onwem nēnye kwa ha ndu ebighi-ebi; ha agaghi-ala kwa n'iyì ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi, ọ dighi kwa onye ọ bula gānapu ha n'akam. 29 Nnam, Nke nyeworom ha, bu Onye uku kachasi ihe nile; ọ dighi kwa onye ọ bula puru inapu ihe n'aka Nnam. 30 Mu onwem na Nnam bu otù. 31 Ndi-Ju tuturu nkume ọzọ ka ha tua Ya. 32 Jisus zara ha, si Ọtutu ọlu ọma ka M'gosiri unu site na Nnam; n'ìhi aha ọlu gini nime ndia Ka unu nātum nkume? 33 Ndi-Ju zara Ya, si, Ọ bughi n'ihi ọlu ọma ka ayi nātu Gi nkume, kama ọ bu n'ihi nkwulu; n'ihi kwa na Gi onwe-gi, ebe I bu madu, I nēme Onwe-gi Chineke. 34 Jisus zara ha, si, Èdeghi ya n'iwu-unu, si, Mu onwem siri, Chi ka unu bu? 35 Ọ buru na Ọ kpọrọ ndi ahu chi, ndi okwu Chineke biaruru (apughi kwa imebi ihe edere n'akwukwọ nso), 36 ùnu onwe-unu nēkwu okwu bayere Onye ahu Nnam doro nsọ zite kwa n'uwa, si, I nēkwulu Chineke; n'ihi na asim, Abum Ọkpara Chineke? 37 Ọ buru na alughm ọlu Nnam, unu ekwelam. 38 Ma ọ buru na aluam ha, ọbuná ma asi na unu ekweghi Mu onwem, nēkwerenu ọlum: ka unu we mara nāmagide kwa na Nnam di nimem, na Mu onwem di kwa nime Nnam. 39 Ha we chọ kwa uzọ ijide Ya: O we pua n'aka-ha. 40 O we je ọzọ gabiga n'ofè Jọdan rue ebe Jọn nēme baptism na mbu; O we n-ogide n'ebe ahu. 41 Ọtutu madu we biakute Ya; ha nāsi kwa, N'ezie ọ dighi ihe-iriba-ama Jọn mere: ma ka ha ra, bú ihe Jọn kwuru bayere Onye a, bu ezi-okwu 42 Ọtutu madu we kwere na Ya n'ebe ahu.

Jọn 11

1 Ma aru otù nwoke adighi ike, bú Lazarọs onye Betani, onye sitere n'obodo ntà Meri na Mata nwa-nne-ya nwanyi. 2 Ma ọ bu Meri ahu nke were manu-otite te Onye-nwe-ayi, were kwa agiri-isi-ya hicha ukwu-Ya abua, onye aru nwa-nne-ya nwoke, bú Lazarọs, nādighi ike. 3 Ya mere umu-nne-ya nwanyi zigara Ya, si, Onye-nwe-ayi, le, aru nke onye ahu I huru n'anya adighi ike. 4 Ma mb͕e Jisus nuru ya, Ọ si, Nriaria nka abughi nke ọnwu, kama ọ bu n'ihi otuto Chineke, ka ewe nye Ọkpara Chineke otuto site na ya. 5 Ma Jisus huru Mata, na nwa-nne-ya nwanyi, na Lazarọs, n'anya. 6 Ya mere mb͕e Ọ nuru na aru-ya adighi ike, mb͕e ahu Ọ nọgidere ubọchi abua n'ebe Ọ nọ. 7 Mb͕e ahu mb͕e nka gasiri Ọ si ndi nēso uzọ-Ya, Ka ayi je Judia ọzọ. 8 Ndi nēso uzọ-Ya si Ya, Rabai, ub͕u a ka ndi-Ju nāchọ uzọ itu Gi nkume; Ì nēje kwa ebe ahu ọzọ? 9 Jisus zara, si, Ọ̀ bughi oge hour iri na abua di n'ehihie? Ọ buru na onye ọ bula ejeghari n'ehihie, ọ dighi-asu ngọngọ, n'ihi na ọ nāhu ìhè nke uwa nka. 10 Ma ọ buru na onye ọ bula ejeghari n'abali, ọ nāsu ngọngọ, n'ihi na ìhè adighi nime ya. 11 Ihe ndia ka O kwuru: mb͕e nka gasiri Ọ si ha, Enyi-ayi Lazarọs adawo n'ura; ma anamaga, ka M'we kpọte ya n'ura. 12 Ya mere ndi nēso uzọ-Ya siri Ya, Onye-nwe-ayi, ọ buru na ọ dawo n'ura, agāzọputa ya. 13 Ma Jisus kwururi okwu bayere ọnwu-ya: ma ndi ahu chère na Ọ nēkwu okwu bayere ida n'ura efu. 14 Ya mere Jisus gwawara ha okwu mb͕e ahu, si, Lazarọs nwuru anwu. 15 Anamaṅuri kwa ọṅu n'ihi unu na adighi m n'ebe ahu, ka unu we kwere; otú ọ di, ka ayi jekuru ya. 16 Ya mere Tomas, onye anākpọ Didimọs, siri ibe-ya ndi nēso Jisus, Ka ayi onwe-ayi je kwa, ka ayi we so Ya nwua. 17 Ya mere mb͕e Jisus biara, Ọ huru na ọ diwori n'ílì ubọchi anọ a. 18 Ma Betani di Jerusalem nso, ihe dika furlong iri na ise n'idi-anya; 19 ma ọtutu n'etiti ndi-Ju biakutereri Mata na Meri, ka ha we kasie ha obi n'ihi nwa-nne-ha. 20 Ya mere mb͕e Mata nuru na Jisus nābia, o je zute Ya: ma Meri nānọdu n'ulo. 21 Ya mere Mata siri Jisus, Onye-nwe-ayi, ọ buru na I nọri n'ebe a, nwa-nnem nwoke agaghi-anwuwori. 22 Ma ọbuná ub͕u a amataram na, ka ihe I gāriọ n'aka Chineke ra, Chineke gēnye Gi. 23 Jisus si ya, Nwa-nne-gi nwoke gēsi n'ọnwu bilie. 24 Mata si Ya, Amataram na o gēsi n'ọnwu bilie na nbilite-n'ọnwu n'ubọchi ikpe-azu. 25 Jisus siri ya, Mu onwem bu nbilite-n'ọnwu na ndu: onye nēkwere na Mu, ọbuná ma asi na ọ nwuru anwu, ọ gādi ndu ọzọ: 26 ọzọ, onye ọ bula nke nādi ndu, nke nēkwere kwa na Mu, ọ gaghi-anwu ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi. I kwere nka? 27 Ọ si Ya, E, Onye-nwe-ayi: Mu onwem ekwerewo na Gi onwe-gi bu Kraist-ayi, Ọkpara Chineke, Onye nābia n'uwa. 28 Mb͕e o kwusiri nka, o we je kpọ Meri nwa-nne-ya nwanyi na nzuzo, si, Onye-ozizí nọ n'ebe a, Ọ nāekpọ kwa gi. 29 Ma nwanyi ahu, mbe ọ nuru ya, o bilie ọsọsọ, we biakute Ya. 30 (Ma Jisus akābiarughi nime obodo ntà ahu, kama Ọ nānọ n'ebe Mata zutere Ya. ) 31 Ya mere ndi-Ju ndi ha na ya di n'ulo, ndi nākasi kwa ya obi, mb͕e ha huru Meri, na o biliri ọsọsọ we pua, ha soro ya, nēchè na ọ nējeru ílì ka o we kwa ákwá n'ebe ahu. 32 Ya mere Meri, mb͕e ọ biara n'ebe Jisus nọ, mb͕e ọ huru Ya, ọ da n'ala n'ukwu-Ya, nāsi Ya, Onye-nwe-ayi, ọ buru na I nọri n'ebe a, nwa-nnem nwoke agaghi-anwuwori. 33 Ya mere mb͕e Jisus huru ya ka ọ nākwa ákwá, na ndi-Ju ndi soro ya bia ka ha nākwa kwa ákwá, Ọ su udè nime mọ-Ya, me kwa ka obi lọ Ya miri, 34 O we si, Òle ebe unu tọb͕ọworo ya? Ha si Ya, Onye-nwe-ayi, Bia, le kwa. 35 Anya-miri puru n'anya Jisus. 36 Ya mere ndi-Ju nāsi, Le otú Ọ huru ya n'anya! 37 Ma ufọdu nime ha siri, Onye a, Nke meghere anya onye ahu kpuru ìsì, Ọ̀ pughi ime kwa ka nwoke a ghara inwu anwu? 38 Ya mere Jisus nābiaru ílì ahu nāsu udè ọzọ nime Onwe-ya. Ma ọ bu ọb͕à, otù nkume nātọb͕ọ kwa n'ọnu-ya. 39 Jisus si, Wepunu nkume ahu. Mata, nwa-nne-nwanyi nke onye ahu nwuruwori, si Ya, Onye-nwe-ayi, ọ nēsì ísì ub͕u a: n'ihi na nka mere ya ubọchi anọ ọ nwuru. 40 Jisus si ya, Àsighi m i na, ọ buru na i kwere, i gāhu ebube Chineke? 41 Ya mere ha wepuru nkume ahu. Ma Jisus weliri anya-Ya elu, si, Nna, ekelem I na I nuru olum. 42 Ma Mu onwem matara na I nānu olum mb͕e nile: ma n'ihi ìgwè madu a nke guzoro gburugburu ka M'kwuru ya, ka ha we kwere na ọ bu Gi onwe-gi ziterem. 43 Ma mb͕e O kwusiri ihe ndia, O were oké olu tie nkpu, si, Lazarọs, puta n'èzí. 44 Onye nwururi anwu putara, ewerewori ákwà-ozu ke ya ukwu na aka; were kwa ichafọ kechie ya iru. Jisus si ha, Tọpunu ya, ghara kwa ya ka ọ la. 45 Ya mere ọtutu n'etiti ndi-Ju, ndi biakutere Meri, ndi le-kwa-ra ihe O mere, ha kwere na Ya. 46 Ma ufọdu n'etiti ha jekuru ndi-Farisi, kọrọ ha ihe Jisus mere. 47 Ya mere ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi kpọrọ nnọkọ-ikpé ka ha zukọ, si, Gini ka ayi nēme? n'ihi na Nwoke a nēme ọtutu ihe-iriba-ama. 48 Ọ buru na ayi arapu Ya otú a, madu nile gēkwere na Ya: ndi Rom gābia kwa napu ebe nke ayi na mba nke ayi. 49 Ma otù onye n'etiti ha, bú Kaiafas, ebe ọ bu onye-isi-nchu-àjà n'arọ ahu, si ha, Unu onwe-unu amataghi ihe ọ bula, 50 unu atuleghi kwa uche na ọ bara unu urù ka otù onye nwua n'ọnọdu ndi-Ju, ka mba-ayi dum ghara ila kwa n'iyì. 51 Ma o kwughi nka site n'onwe-ya: kama ebe ọ bu onye-isi-nchu-àjà n'arọ ahu, o buru amuma na Jisus gaje inwu anwu n'ọnọdu mba ahu; 52 ọ bughi kwa nání n'ọnọdu mba ahu, kama ka O we me kwa ka umu Chineke ndi b͕asaworo zukọ n'otù. 53 Ya mere site n'ubọchi ahu ha b͕ara ìzù ka ha we b͕ue Ya. 54 Ya mere Jisus adighi-ejeghari n'iru ọra madu n'etiti ndi-Ju ọzọ, kama O si n'ebe ahu je ba n'ala nke di ọhia nso, ba n'obodo anākpọ Ifraim; O we nọgide n'ebe ahu, Ya na ndi nēso uzọ-Ya. 55 Ma ememe ngabiga nke ndi-Ju di nso: ọtutu madu we si n'ala ndi-Ju rigoro Jerusalem mb͕e ememe ngabiga ahu akērughi, ime onwe-ha ka ha di ọcha. 56 Ya mere ha nāchọ Jisus, we nēkwurita n'etiti onwe-ha, mb͕e ha guzoro n'ulo uku Chineke, si, Gini ka unu nēchè? Nà Ọ gaghi-abia n'ememe a ma-ọli? 57 Ma ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi nyereri iwu ka, ọ buru na onye ọ bula mara ebe Ọ nọ, ka o gosi ya, ha we jide Ya.

Jọn 12

1 Ya mere mb͕e ubọchi isi fọduru ka ememe ngabiga rue, Jisus biaruru Betani, ebe Lazarọs nọ, onye Jisus mere ka o si na ndi nwuru anwu bilie. 2 Ya mere ha siri Ya nri-anyasi n'ebe ahu: Mata nēje kwa ozi; ma Lazarọs bu otù onye n'etiti ndi Ya na ha nọduru na nri. 3 Ya mere Meri were manu-otite ezi nard, di oké ọnu-ahia nke-uku, nke ọtùtù-ya ruru otù pound, te ukwu Jisus abua, were kwa agiri-isi-ya hicha ukwu-Ya: ísì manu-otite ahu we juputa ulo ahu. 4 Ma Judas Iskariot, otù onye nime ndi nēso uzọ-Ya, nke gaje irara Ya nye, si, 5 N'ìhi gini ka anēreghi manu-otite a ọgu shilling iri na ise, were ya nye ndi-ob͕eye? 6 Ma nka ka o kwuru, ọ bughi n'ihi na ọ kpọrọ ndi-ob͕eye ihe; kama n'ihi na ọ bu onye-ori, na ebe o ji àkpà-ego, ọ nēwepu ihe anētiye nime ya. 7 Ya mere Jisus siri, Rapu nwanyi a ka o we debe ya rue ubọchi olìlìm. 8 N'ihi na unu nwere ndi-ob͕eye n'etiti unu mb͕e nile; ma unu enweghi Mu onwem mb͕e nile. 9 Ya mere ọra madu n'etiti ndi-Ju mara na Ọ nọ n'ebe ahu: ha we bia, ọ bughi n'ihi nání Jisus, kama ka ha we le kwa Lazarọs, onye Ọ mereri ka o si na ndi nwuru anwu bilie. 10 Ma ndi-isi-nchu-àjà b͕ara ìzù ka ha we b͕u kwa Lazarọs; 11 n'ihi na ọ bu n'ihi ya ka ọtutu nime ndi-Ju nāpu, nēkwere kwa na Jisus. 12 N'echi-ya oké ìgwè madu nke biara ememe ahu, mb͕e ha nuru na Jisus nābia Jerusalem, 13 ha chiri igu nkwu, pua izute Ya, we nēti nkpu, si, Hosanna: Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n'aha Onye-nwe-ayi, bú Eze nke Israel. 14 Ma mb͕e Jisus chọtasiri otù nwa-inyinya-ibu, Ọ nọkwasi ya; dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, 15 Atula egwu, ada Zaion: le, Eze-gi nābia, nānọkwasi nwa inyinya-ibu. 16 Ihe ndia ndi nēso uzọ-Ya amaghi na mbu: kama mb͕e enyereri Jisus otuto, mb͕e ahu ka ha chetara na edereri ihe ndia bayere Ya n'akwukwọ nsọ, na ha me-kwa-ra Ya-ri ihe ndia. 17 Ya mere ìgwè madu ahu ndi ha na Ya nọ mb͕e O siri n'ílì kpọputa Lazarọs, me kwa ka o si na ndi nwuru anwu bilie, ha nāb͕a àmà. 18 Ọ bu kwa n'ihi nka ka ìgwè madu ahu puru izute Ya, n'ihi na ha nuru na O mereri ihe-iriba-ama nka. 19 Ya mere ndi-Farisi siritara onwe-ha, Lenu na okwu-unu abaghi n'ihe: le, uwa ejesowo Ya n'azu. 20 Ma ndi-Grik ufọdu di n'etiti ndi nārigo ka ha kpọ isi ala nye Chineke n'ememe ahu: 21 ya mere madu ndia biakutere Filip, nke bu onye Betsaida nke Galili, ha we kpere ya, si, Onye-nwe-ayi, ayi nāchọ ihu Jisus. 22 Filip bia gwa Andru: Andru we bia, ya na Filip, ha we gwa Jisus. 23 Jisus we za ha, si, Oge hour abiawo, ka ewe nye Nwa nke madu otuto. 24 N'ezie, n'ezie, asim unu, Ọ buru na nkpuru ọka adaghi n'ala we nwua, nání ya onwe-ya nānọgide; ma ọ buru na ọ nwuru, ọ mia ọtutu nkpuru. 25 Onye nāhu ndu-ya n'anya nētufu ya; onye nākpọ kwa ndu-ya asì n'uwa nka gēdebe ya rue ndu ebighi-ebi. 26 Ọ buru na onye ọ bula nējerem ozi, ya som; ebe Mu onwem nọ kwa, n'ebe ahu ka onye nējerem ozi gānọ kwa: ọ buru na onye ọ bula nējerem ozi, ya ka Nnam gāsọpuru. 27 Ub͕u a ka nkpuru-obim nālọ miri; gini ka M'gēkwu kwa? Nna, zọputam n'oge hour nka. Ma n'ihi nka ka M'biaruru oge hour nka. 28 Nna, nye aha-Gi otuto. Ya mere otù olu sitere n'elu-igwe da, si, Enyerem ya otuto, M'gēnye kwa Ya otuto ọzọ. 29 Ya mere ìgwè madu ahu, ndi guzoro nso, ndi nu-kwa-ra ya, siri na éb͕è-elu-igwe dara: ndi ọzọ siri, Mọ-ozi agwawo Ya okwu. 30 Jisus zara, si, Ọ bughi n'ihim ka olu a daworo, kama ọ bu n'ihi unu. 31 Ub͕u a ka ikpé uwa nka di: ub͕u a ka agāchupu onye-isi uwa nka. 32 Mu onwem, ọ buru na eweliem elu site n'ala, M'gādọrọ kwa madu nile nye onwem. 33 Ma nka ka O kwuru, nēgosi aha ọnwu Ọ gaje inwu. 34 Ya mere ìgwè madu ahu zara Ya, si, Ayi onwe-ayi nuru site n'iwu-ayi na Kraist-ayi nānọgide rue mb͕e ebighi-ebi: Gì onwe-gi si kwa aṅa si, Aghaghi iweli Nwa nke madu elu? Ònye bu Nwa nke madu a? 35 Ya mere Jisus siri ha, Nwa oge fọduru ka Ìhè ahu gādi n'etiti unu. Nējegharinu mb͕e unu nēnwe Ìhè ahu, ka ọchichiri ghara ijide unu: onye nējeghari n'ọchichiri adighi-amata ebe ọ nēje. 36 Mb͕e unu nēnwe Ìhè ahu, kwerenu n'Ìhè ahu, ka unu we ghọ umu Ìhè. Ihe ndia ka Jisus kwuru, O we je zonari ha Onwe-ya. 37 Ma ọ bu ezie na O mereri ọtutu ihe-iriba-ama di otú a n'iru ha, ma ha ekweghi na Ya: 38 ka okwu Aisaia onye-amuma we mezu, nke o kwuru, si, Onye-nwe-ayi, ònye kwere ihe ayi nuworo? Ogwe-aka Onye-nwe-ayi kwa, n'àru onye ka ekpugheworo ya? 39 N'ihi nka ha apughi ikwere, n'ihi na Aisaia siri ọzọ, 40 O mewo ka anya-ha kpue ìsì, O me-kwa-ra ka obi-ha me etili; Ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ, ghara kwa iwere obi-ha ghọta, Ghara kwa ichighari, Ka M'ghara kwa ime ka aru di ha ike. 41 Ihe ndia ka Aisaia kwuru, n'ihi na ọ huru ebube-Ya; o kwu-kwa-ra okwu bayere Ya. 42 Otú ọ di, ọbuná site n'etiti ndi-isi ọtutu kwere na Ya; ma n'ihi ndi-Farisi ha ekwuputaghi ya, ka aghara ichupu ha n'ulo-nzukọ: 43 n'ihi na ha huru otuto madu n'anya kari otuto Chineke. 44 Jisus we tie nkpu, si, Onye kwere na Mu, ọ bughi na Mu ka o kwere, kama ọ bu n'Onye ziterem. 45 Onye nāhum nāhu kwa Onye ziterem. 46 Mu onwem abiawo n'uwa ibu ìhè, ka onye ọ bula nke kwere na Mu we ghara inọgide n'ọchichiri. 47 Ọ buru kwa na onye ọ bula anu okwum, ghara idebe ha, Mu onwem agaghi-ekpe ya ikpé: n'ihi na abiaghm ka M'kpe uwa ikpé, kama ka M'zọputa uwa. 48 Onye nājum, nke nādighi-anara kwa okwum, o nwere onye nēkpe ya ikpé: okwu nke M'kwuru, okwu ahu gēkpe ya ikpé n'ubọchi ikpe-azu. 49 N'ihi na Mu onwem ekwughi site n'Onwem; kama Nna ziterem, Ya onwe-ya enyewom iwu, ihe M'gēkwu, na otú M'gēkwu ya. 50 Amata-kwa-ram na ihe O nyere n'iwu bu ndu ebighi-ebi: ya mere ihe Mu onwem nēkwu, dika Nnam gwaworom okwu, otú a ka M'nēkwu.

Jọn 13

1 Ma mb͕e ememe ngabiga akērughi, ebe Jisus matara na oge hour Ya abiawo ka O si n'uwa nka lakuru Nna-Ya, ebe Ọ huru ndi nke aka Ya nọ n'uwa n'anya, Ọ huru ha n'anya rue ogwugwu ihe nile. 2 Mb͕e ha nēri nri-anyasi, mb͕e ekwensu tinyesiri ub͕u a n'obi Judas Iskariot, nwa Saimon, ka ọ rara Ya nye, 3 Jisus, ebe Ọ matara na nna-Ya nyere Ya-ri ihe nile n'aka, na O si-kwa-ra n'ebe Chineke nọ puta, nālakuru kwa Chineke, 4 O bilie na nri-anyasi, wusa uwe-Ya, we chiri ákwà anēji hicha aru, we ke Onwe-ya n'úkwù. 5 Mb͕e ahu O tinye miri n'ihe anēji sa aru, we malite isa ukwu ndi nēso uzọ-Ya, na iji ákwà anēji hicha aru nke O kereri n'úkwù hicha ukwu-ha. 6 Ya mere Ọ biakute Saimon Pita. Ọ si Ya, Onye-nwe-ayi, Gì onwe-gi nāsa ukwum? 7 Jisus zara, si Ya, Ihe Mu onwem nēme, gi onwe-gi amataghi ya ub͕u a; ma i gāmara mb͕e ihe ndia gasiri. 8 Pita si Ya, I gaghi-asa ukwum ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi. Jisus zara ya, si, Ọ buru na asaghm i, Mu na gi enweghi òkè ọ bula. 9 Saimon Pita si Ya, Onye-nwe-ayi, ọ bughi nání ukwum, kama akam abua kwa na isim. 10 Jisus si ya, Onye asaworo aru, nkpà isa aru ọzọ adirighi ya ma-ọbughi isa ukwu-ya, kama aru-ya dum di ọcha: unu onwe-unu di kwa ọcha, ma ọ bughi unu nile. 11 N'ihi na Ọ matara onye gaje irara Ya nye; n'ihi nka ka Ọ siri, Ọ bughi unu nile di ọcha. 12 Ya mere mb͕e Ọ sasiri ukwu-ha, chiri kwa-uwe Ya, nọdu kwa ala ọzọ, Ọ si ha, Ùnu mara ihe M'meworo unu? 13 Unu onwe-unu nākpọm, Onye-ozizí, na, Onye-nwe-ayi: unu nēkwu kwa nke-ọma; n'ihi na ọ bu otú M'di. 14 Ya mere, Ọ buru na Mu onwem, bú Onye-nwe-unu na Onye-ozizí-unu, sara ukwu-unu, unu onwe-unu nēji kwa ugwọ isarita ukwu ibe-unu. 15 N'ihi na enyewom unu ihe-nṅomi, ka unu onwe-unu we nēme kwa dika Mu onwem mere unu. 16 N'ezie, n'ezie, asim unu, Orù adighi-aka onye-nwe-ya uku; onye-ozi adighi-aka kwa onye zitere ya uku. 17 Ọ buru na unu matara ihe ndia, ngọzi nādiri unu ma asi na unu nēme ha. 18 Ekwughm okwu bayere unu nile: Mu onwem matara ndi M'rọputara: kama ọ bu ka emezu ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, Onye nēri nrim buliri ikiri-ukwu-ya imegidem. 19 Site n'ub͕u a anamagwa unu mb͕e ọ kērughi, ka unu we kwere na Mu onwem bu Ya mb͕e ọ bula ọ gēru. 20 N'ezie, n'ezie, asim unu, Onye nānara onye ọ bula M'gēzite, Mu ka ọ nānara; onye nānaram nānara kwa Onye ziterem. 21 Mb͕e Jisus kwusiri okwu ndia, obi lọrọ Ya miri nime mọ-Ya, O we b͕a àmà, si, N'ezie, n'ezie, asim unu, na otù onye n'etiti unu gāraram nye. 22 Ndi nēso uzọ-Ya nēlerita onwe-ha anya, nēnwe obi abua onye Ọ nēkwu okwu bayere ya. 23 Otù onye n'etiti ndi nēso uzọ-Ya nānọdu na nri nādabere n'obi Jisus, onye Jisus huru n'anya. 24 Ya mere Saimon Pita fere onye ahu isi, we si ya, Gwa ayi onye O nēkwu okwu bayere ya. 25 Onye ahu dabere, otú ọ di, n'obi Jisus, we si Ya, Onye-nwe-ayi, ònye ka ọ bu? 26 Ya mere Jisus za, si, Ọ bu onye ahu, nke Mu onwem gēsuru iberibe achicha n'ofé, nye ya. Ya mere, mb͕e O susiri iberibe achicha ahu, O were ya nye Judas, nwa Saimon Iskariot. 27 Mb͕e enyesiri ya iberibe achicha ahu, mb͕e ahu Setan batara nime onye ahu. Ya mere Jisus si ya, Ihe i nēme, me ya ọsọsọ. 28 Ma ọ dighi onye ọ bula nime ndi nọduru na nri mara ihe O ji gwa ya okwu a. 29 N'ihi na ufọdu nēchè, ebe Judas ji àkpà-ego, na Jisus siri ya, Zuta ihe di ayi nkpà n'ememe; ma-ọbu, ka o nye ndi-ob͕eye ihe. 30 Ya mere mb͕e ọ narasiri iberibe achicha ahu ọ pua ngwa ngwa: ma ọ bu abali. 31 Ya mere mb͕e ọ pururi, Jisus si, Ub͕u a ka enyere Nwa nke madu otuto, enye-kwa-ra Chineke otuto nime Ya; 32 Chineke gēnye kwa Ya otuto nime Onwe-ya, ngwa ngwa ka Ọ gēnye kwa Ya otuto. 33 Umu-ntakiri, ọ fọduru nwa oge Mu na unu gānọ. Unu gāchọm: dika M'gwa-kwa-ra ndi-Ju, si, Ebe Mu onwem nāla, unu onwe-unu apughi ibia; otú ahu ka M'nāsi unu ub͕u a. 34 Iwu ọhu M'nēnye unu, ka unu hurita ibe-unu n'anya; dika M'huru unu n'anya, ka unu onwe-unu hurita kwa ibe-unu n'anya. 35 Madu nile gēji nka mara na unu bu ndi nēso uzọm, ọ buru na unu enwerita ihu-n'anya n'ebe ibe-unu nọ. 36 Saimon Pita si Ya, Onye-nwe-ayi, Òle ebe I nāla? Jisus zara, si, Ebe M'nāla, i pughi isom ub͕u a; ma i gēsom ma emesia. 37 Pita si Ya, Onye-nwe-ayi, n'ìhi gini ka m'nāpughi iso Gi ọbuná ub͕u a? m'gātọb͕ọ ndum n'ihi Gi. 38 Jisus zara, si, Ì gātọb͕ọ ndu-gi n'ihim? N'ezie, n'ezie, asim i, Oke-ọkuku agaghi-akwa, rue mb͕e i gāgọnarim ub͕ò atọ.

Jọn 14

1 Ka obi-unu ghara ilọ miri: kwerenu na Chineke, kwere-kwa-nu na Mu. 2 N'ulo Nnam ọtutu ebe-obibi di; ọ buru na ọ bughi otú a, M'gāgwawori unu; n'ihi na anamaga idoziri unu ebe. 3 Ọ buru kwa na Mu aga idoziri unu ebe, agajem ibia ọzọ, M'gānara kwa unu nye Onwem; ka unu onwe-unu we nọ kwa ebe Mu onwem nọ. 4 Ebe Mu onwem nāla, unu mata-kwa-ra uzọ-ya. 5 Tomas si Ya, Onye-nwe-ayi, ayi amataghi ebe I nāla; àyi si aṅa mata uzọ-ya? 6 Jisus si ya, Mu onwem bu uzọ, na ezi-okwu, na ndu: ọ dighi onye ọ bula nābiakute Nnam, ma-ọbughi site na Mu. 7 Ọ buru na unu maramri, unu gāmatawo-kwa-ri Nnam: site n'ub͕u a unu mara Ya, unu ahuwo kwa Ya. 8 Filip si Ya, Onye-nwe-ayi, gosi ayi Nna ahu, ọ gēzu-kwa-ra ayi. 9 Jisus si ya, Ogologo oge di otú a ka Mu na gi nọ, ma ì mataghm, Filip? onye huworom anya ahuwo Nnam anya; gì onwe-gi si aṅa si, Gosi ayi Nnam ahu? 10 Ì kweghi na Mu onwem nọ nime Nnam, Nnam nọ kwa nimem? okwu Mu onwem nāgwa unu ekwughi m n'Onwem: ma Nnam Nke nēbi nimem nālu ọlu-Ya. 11 Kwerenum na Mu onwem nọ nime Nnam, Nnam nọ kwa nimem: ma ọ bughi, kwerenum n'ihi ọlum onwe-ha. 12 N'ezie, n'ezie, asim unu, Onye nēkwere na Mu, ọlu Mu onwem nālu ka onye ahu gālu kwa; ọlu ka ndia uku ka ọ gālu kwa; n'ihi na Mu onwem nāgakuru Nnam. 13 Ihe ọ bula unu gāriọ kwa n'aham, ihe ahu ka M'gēme, ka ewe nye Nnam otuto nime Ọkpara-Ya. 14 Ọ buru na unu gāriọm ihe ọ bula n'aham, nke ahu ka M'gēme. 15 Ọ buru na unu nāhum n'anya, unu gēdebe ihe nile M'nyere n'iwu. 16 Mu onwem gēkpe-kwa-ra Nnam, Ọ gēnye kwa unu Onye-nkasi-obi ọzọ, ka Ọ nọyere unu rue mb͕e ebighi-ebi, 17 bú Mọ nke ezi-okwu: Onye uwa nāpughi inara; n'ihi na ọ dighi-ahu ya, ọ dighi-ama kwa Ya: unu onwe-unu mara Ya; n'ihi na Ya na unu nānọgide, Ọ gānọ kwa nime unu. 18 M'gaghi-arapu unu ka umu-nb͕ei: agajem ibiakute unu. 19 Ọ fọduru nwa oge, uwa ahukwaghm ọzọ; ma unu onwe-unu nāhum: unu onwe-unu gādi kwa ndu, n'ihi na Mu onwem nādi ndu. 20 N'ubọchi ahu unu onwe-unu gāmara na Mu onwem nọ nime Nnam, na unu onwe-unu nọ kwa nimem, na Mu onwem nọ kwa nime unu. 21 Onye nwere ihe M'nyere n'iwu, nke nēdebe kwa ha, ọ bu onye ahu nāhum n'anya: onye nāhum n'anya, Nnam gāhu kwa ya n'anya, Mu onwem gāhu kwa ya n'anya, were kwa Onwem gosi ya. 22 Judas (ọ bughi Iskariot) si Ya, Onye-nwe-ayi, Gini putaworo na I gaje iwere Onwe-gi gosi ayi, ma ọ bughi uwa? 23 Jisus zara, si ya, Ọ buru na madu ahum n'anya, ọ gēdebe okwum: Nnam gāhu kwa ya n'anya, Ayi gābiakute kwa ya, nēme kwa ebe-obibi-Ayi n'ebe ọ nọ. 24 Onye nādighi-ahum n'anya adighi-edebe okwum nile: okwu nke unu nānu abughi kwa nkem, kama ọ bu nke Nna Onye ziterem. 25 Okwu ndia ka M'gwaworo unu, mb͕e Mu na unu nānọgide. 26 Ma Onye-nkasi-obi ahu, bú Mọ Nsọ, Onye Nnam gēzite n'aham, Onye ahu gēzí unu ihe nile, me kwa ka unu cheta okwu nile Mu onwem gwara unu. 27 Udo ka M'rapuru unu; udo nkem ka M'nēnye unu: ọ bughi dika uwa nēnye ka Mu onwem nēnye unu. Ka obi-unu ghara ilọ miri, ka ọ ghara kwa itu ujọ. 28 Unu nuru na Mu onwem siri unu, Anamala, biakute kwa unu. Ọ buru na unu hurum n'anya, unu gāṅuwori ọṅu, n'ihi na anamagakuru Nnam: n'ihi na Nnam ka Mu onwem uku. 29 Ub͕u a agwawokwam unu mb͕e ọ kērughi, ka unu we kwere mb͕e ọ bula ọ gēru. 30 Ọ dighi ọtutu okwu Mu na unu gēkwu ọzọ site n'ub͕u a, n'ihi na onye-isi nke uwa nka nābia: ọ dighi kwa ihe ọ bula o nwere nimem; 31 ma ka uwa we mara na anamahu Nnam n'anya, ka ọ mara kwa na dika Nnam nyerem iwu, otú ahu ka M'nēme. Bilienu, ka ayi si n'ebe a pua.

Jọn 15

1 Mu onwem bu ezi osisi vine, Nnam bu kwa onye-ọlu-ubi. 2 Alaka ọ bula nimem nke nādighi-ami nkpuru, O wepu ya: alaka ọ bula nke nāmi nkpuru, O nēme kwa ya ka ọ di ọcha, ka o we mia nkpuru kari. 3 Ub͕u a unu onwe-unu di ọcha n'ihi okwu nke M'gwaworo unu. 4 Nọgidenu nimem, Mu onwem kwa nime unu. Dika alaka nāpughi imi nkpuru n'onwe-ya, ọ buru na ọ nọgideghi n'osisi vine; otú a ka unu onwe-unu nāpughi, ọ buru na unu anọgideghi nimem. 5 Mu onwem bu osisi vine ahu, unu onwe-unu bu alaka nkem: Onye nānọgide nimem, Mu onwem kwa nime ya, onye ahu nāmi nkpuru ri nne: n'ihi na unu apughi ime ihe ọ bula ma Mu anọghi ya. 6 Ọ buru na onye ọ bula anọgideghi nimem, atupu ya n'èzí dika alaka, ọ kpọnwu kwa; ha we chikọta ha, tubà ha n'ọku, ewe rechapu ha ọku. 7 Ọ buru na unu nānọgide nimem, ọ buru kwa na okwum nānọgide nime unu, riọnu ihe o bula unu nāchọ, agēme-kwa-ra unu ya. 8 Nime nka ka anēnye Nnam otuto, ka unu nāmi nkpuru ri nne; unu gābu kwa ndi nēso uzọm. 9 Dika Nnam hurum n'anya, Mu onwem hu-kwa-ra unu n'anya: nọgidenu nime ihu-n'anyam. 10 Ọ buru na unu edebe ihe nile M'nyere n'iwu, unu gānọgide n'ihu-n'anyam; dika Mu onwem debeworo ihe nile Nnam nyere n'iwu, nọgide kwa n'ihu-n'anya-Ya. 11 Ihe ndia ka M'gwaworo unu, ka ọṅùm we di nime unu, ka ọṅù-unu we zu kwa. 12 Nka bu ihe M'nyere n'iwu ka unu hurita ibe-unu n'anya, dika M'huru unu n'anya. 13 Ọ dighi onye ọ bula nwere ihu-n'anya kari nka uku, ka madu tọb͕ọ ndu-ya n'ihi ndi-enyì-ya. 14 Unu onwe-unu bu ndi-eyìm, ma ọ buru na unu eme ihe Mu onwem nēnye unu n'iwu. 15 Akpọkwaghm unu ndi-orù ọzọ site n'ub͕u a; n'ihi na orù adighi-amara ihe onye-nwe-ya nēme: ma akpọwom unu ndi-eyì; n'ihi na ihe nile M'nuru site n'ọnu Nnam ka M'mere ka unu mara. 16 Ọ bughi unu onwe-unu rọputaram, kama ọ bu Mu onwem rọputara unu, weputa kwa unu iche, ka unu onwe-unu we je mia nkpuru, ka nkpuru-unu we nọgide kwa: ka ihe ọ bula unu gāriọ Nnam n'aham, ka O we nye unu ya. 17 Ihe ndia ka M'nēnye unu n'iwu, ka unu we hurita ibe-unu n'anya. 18 Ọ buru na uwa akpọ unu asì, unu mara na ọ kpọwo Mu onwem asì mb͕e ọ kākpọghi unu asì. 19 Ọ buru na unu sitere n'uwa, uwa gāhu ihe nke aka ya n'anya: ma n'ihi na unu esiteghi n'uwa, kama Mu onwem rọputara unu nime uwa, n'ihi nka uwa nākpọ unu asì. 20 Chetanu okwu Mu onwem gwara unu, Orù adighi-aka onye-nwe-ya uku. Ọ buru na ha sob͕urum, ha gēsọb͕u kwa unu; ọ buru na ha debere okwum, ha gēdebe kwa nke unu. 21 Ma ihe ndia nile ka ha gēme unu n'ihi aham, n'ihi na ha amataghi Onye ziterem. 22 Ọ buru na abiaghm, ọ buru kwa na agwaghm ha okwu, ha agaghi-enwewori nmehie: ma ub͕u a ha enweghi ihe-agugọ bayere nmehie-ha. 23 Onye nākpọm asì nākpọ kwa Nnam asì. 24 Ọ buru na alughm ọlu n'etiti ha nke onye ọzọ nālughi, ha agaghi-enwewori nmhie: ma ub͕u a ha ahuwo kpọ kwa Mu na Nnam asì. 25 Ma nka mere, ka okwu edeworo n'iwu-ha we mezu, Ha kpọrọm asì n'efu. 26 Ma mb͕e ọ bula Onye-nkasi-obi ahu gābia, Onye Mu onwem gēsi n'ebe Nnam nọ zitere unu, bú Mọ nke ezi-okwu, Onye si na Nnam puta, Onye ahu gāb͕aram àmà: 27 unu onwe-unu nāb͕a kwa àmà, n'ihi na Mu na unu nọ site na mbu.

Jọn 16

1 Okwu ndia ka M'gwaworo unu, ka ewe ghara ime ka unu ma n'ọnyà. 2 Ha gāchupu unu nime ulo-nzukọ: e, oge hour nābia, ka ọ gābu na onye ọ bula nke gēb͕u unu gēchè na ọ nējere Chineke ozi. 3 Ihe ndia ka ha gēme kwa, n'ihi na ha amaghi Nnam, ha amaghi kwa Mu. 4 Ma okwu ndia ka M'gwaworo unu, ka, mb͕e ọ bula oge hour ha gābia, ka unu we cheta ha, na Mu onwem gwara unu. Ma agwaghm unu okwu ndia site na mbu, n'ihi na Mu na unu nọri. 5 Ma ub͕u a anamalakuru Onye ziterem; ọ dighi kwa onye ọ bula nime unu nājum, Òle ebe I nāla? 6 Kama n'ihi na M'gwawo unu okwu ndia, ihe-nwuta ejuputawo obi-unu. 7 Otú ọ di, Mu onwem nāgwa unu ezi-okwu; Ọ bu ihe bara unu urù ka Mu onwem la: n'ihi na asi na alaghm, Onye-nkasi-obi ahu agaghi-abiakute unu; ma ọ buru na alam, M'gēzite Ya nye unu. 8 Onye ahu, mgbe Ọ gābia, Ọ gātu kwa uwa nmehie, na ezi omume, na ikpé, n'anya: 9 nmehie, n'ihi na ha ekweghi na Mu; 10 ezi omume, n'ihi na anamalakuru Nnam, unu adighi-ahu-kwam ọzọ site n'ub͕u a; 11 ikpé, n'ihi na ekpewo onye-isi uwa nka ikpé. 12 Enwerem ọtutu ihe ọzọ igwa unu, ma unu apughi ibūru ha ub͕u a. 13 Ma mb͕e ọ bula Onye ahu gābia, bú Mọ nke ezi-okwu, Ọ gēdubà unu n'ezi-okwu nile: n'ihi na Ọ gaghi-ekwu n'Onwe-ya; kama ka ihe Ọ nānu ra, ihe ndia ka Ọ gēkwu: Ọ gākọ-kwa-ra unu ihe nile nke nābia. 14 Onye ahu gēto Mu onwem: n'ihi na Ọ gēwere n'ihe nkem, kọ-kwa-ra unu ya. 15 Ka ha ra, bú ihe nile Nnam nēnwe, bu nkem: n'ihi nka ka M'siri, na Ọ nēwere n'ihe nkem, gākọ-kwa-ra unu ya. 16 Ọ fọduru nwa oge, unu adighi-ahukwam, ọzọ kwa, ọ fọduru nwa oge, unu gāhukwam. 17 Ya mere ufọdu nime ndi nēso uzọ-Ya siritara ibe-ha, Gini bu okwu a nke Ọ nāgwa ayi, si, Ọ fọduru nwa oge, unu adighi-ahukwam, ọzọ kwa, ọ fọduru nwa oge, unu gāhukwam: na, N'ihi na anamalakuru Nnam? 18 Ya mere ha nāsi, Gini bu okwu a nke Ọ nēkwu, Ọ fọduru nwa oge? Ayi amataghi ihe Ọ nēkwu. 19 Jisus mara na ha nāchọ iju Ya, O we si ha, Ùnu nājurita onwe-unu ihe bayere nka, na M'siri, Ọ fọduru nwa oge, unu adighi-ahukwam ọzọ; ọzọ kwa, ọ fọduru nwa oge, unu gāhukwam? 20 N'ezie, n'ezie, asim unu, na unu onwe-unu gēti nkpu ákwá, kwa kwa ákwá, ma uwa gāṅuri ọṅu: ọ gēwuta unu onwe-unu, ma nwuta-unu gāghọ ọṅù. 21 Nwanyi, mb͕e ọ bula ime nēme ya, o nwere ihe-nwuta, n'ihi na oge hour ya abiawo: ma mb͕e ọ bula ọ muputara nwa, o chetaghi ahuhu-ya ọzọ, n'ihi ọṅù-ya na amuputara madu n'uwa. 22 Ya mere unu onwe-unu nēnwe kwa ihe-nwuta ub͕u a: ma M'gāhu unu ọzọ, obi-unu gāṅuri kwa ọṅu, ọ dighi kwa onye ọ bula gānara unu ọṅù-unu. 23 N'ubọchi ahu ọ dighi ihe ọ bula unu gājum. N'ezie, n'ezie, asim unu, Ọ buru na unu gāriọ Nnam ihe ọ bula, Ọ gēnye unu ya n'aham. 24 Rue ub͕u a unu akāriọghi ihe ọ bula n'aham: riọnu, unu gāriọta kwa, ka ọṅù-unu we zue oke. 25 Agwawom unu ihe ndia n'ilu: oge hour nābia, mb͕e M'nāgaghi-agwa unu okwu n'ilu ọzọ, kama M'gāgwawa unu okwu bayere Nnam. 26 N'ubọchi ahu unu gāriọ n'aham: ma asighm unu, na Mu onwem gēkpere Nnam n'ihi unu; 27 n'ihi na Nnam onwe-ya nāhu unu n'anya, n'ihi na unu onwe-unu huworom n'anya, kwere kwa na Mu onwem siri n'ebe Nnam nọ puta. 28 Esirim na Nnam puta, abiawokwam n'uwa: ọzọ, anamarapu uwa, nāgakuru kwa Nnam. 29 Ndi nēso uzọ-Ya si, Le, ub͕u a I nēkwuwa okwu, I dighi-atu kwa ilu. 30 Ub͕u a ayi nāmata na I matara ihe nile, na ọ dighi kwa Gi nkpà ka onye ọ bula jua Gi: nka ka ayi ji kwere na I siri n'ebe Chineke nọ puta. 31 Jisus zara ha, si, Ọ̀ bu ub͕u a ka unu kwere? 32 Le, oge hour nābia, ọ biawo kwa, ka unu gāb͕asa, onye ọ bula ọ la na nke ya, unu gārapu kwa nání Mu: otú ọ di, nání Mu anọghi, n'ihi na Mu na Nnam nọ. 33 Okwu ndia ka M'gwaworo unu, ka unu we nwe udo nimem. N'uwa unu nēnwe nkpab͕u: ma nwenu obi-ike; Mu onwem emeriwo uwa.

Jọn 17

1 Okwu ndia ka Jisus kwuru: O we welie anya-Ya le elu-igwe, si, Nnam oge hour abiawo; nye Ọkpara-Gi otuto, ka Ọkpara-Gi we nye Gi Otuto: 2 dika I nyere Ya ike n'ebe madu nile nọ, ka ihe ọ bula I nyeworo Ya, ka O we nye ha ndu ebighi-ebi. 3 Ma nka bu ndu ebighi-ebi ahu, ka ha mara Gi, Nke nání Gi bu ezi Chineke, mara kwa Onye I zitere, bú Jisus Kraist. 4 Mu onwem nyere Gi otuto n'elu uwa, ebe M'luzuru ọlu I nyeworom ka M'lua. 5 Nna, Gi onwe-gi were kwa otuto nke M'nwere n'ebe I nọ mb͕e uwa akādighi nyem otuto ub͕u a nebe Gi onwe-Gi nọ. 6 Emerem ka aha-Gi puta ìhè nye ndi I nyerem site 'uwa: Gi onwe-gi nwere ha, I were kwa ha nyem; ha edebewo kwa okwu-Gi. 7 Ha mara ub͕u a na ihe nile, ka ha ra, bú nke I nyeworom, si n'ebe I nọ puta: 8 n'ihi na okwu I nyerem ka M'nyeworo ha; ha onwe-ha we nara ha, mara kwa n'ezie na esim n'ebe I nọ puta, ha kwere kwa na Gi onwe-gi ziterem. 9 Mu onwem nēkpe ekpere bayere ha: ọ bughi uwa ka M'nēkpe ekpere bayere ya, kama anamekpe ekpere bayere ndi I nyeworom; n'ihi na ha bu nke Gi: 10 ihe nile nke bu nkem bu kwa nke Gi, nke Gi bu kwa nkem: enyewokwam otuto nime ha. 11 Anọkwaghm n'uwa ọzọ, ma ndia nọ n'uwa, Mu onwem nābiakute kwa Gi. Nna di nsọ, nēdebe ha n'aha-Gi nke I nyeworom, ka ha we buru otù, dika Ayi onwe-ayi bu. 12 Mb͕e Mu na ha nọri, Mu onwem nēdebe ha n'aha-Gi nke I nyeworom: eche-kwa-ram ha, ọ dighi kwa onye ọ bula nime ha lara n'iyì, ma-ọbughi nwa nke ila-n'iyì ahu; ka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ we mezu. 13 Ma anamabiakute Gi ub͕u a; okwu ndia ka M'nēkwu kwa nuwa, ka ha we nwe ọṅùm ka o zuworo nime onwe-ha. 14 Mu onwem enyewo ha okwu-Gi; uwa kpọ-kwa-ra ha asì, n'ihi na ha esiteghi n'uwa, dika Mu onwem nēsiteghi n'uwa. 15 Ekpeghm ekpere ka I wepu ha n'uwa, kama ka I debe ha ka ha pua n'aka ajọ onye ahu. 16 Ha esiteghi n'uwa, dika Mu onwem nēsiteghi n'uwa. 17 Were ezi-okwu do ha nsọ: okwu-Gi bu ezi-okwu. 18 Dika I zigaram nime uwa, Mu onwem ziga-kwa-ra ha nime uwa. 19 N'ihi ha ka Mu onwem nēdo kwa Onwem nsọ, ka ewe do kwa ha onwe-ha nsọ n'ezi-okwu. 20 Ọ bughi kwa nání ndia ka M'nēkpe ekpere bayere ha, kama anamekpe kwa ekpere bayere ndi kwere na Mu site n'okwu-ha; 21 ka ha nile we buru otù; dika Gi onwe-gi di nimem, dika Mu onwem di kwa nime Gi, Nna, ka ha onwe-ha we di kwa nime Ayi: ka uwa we kwere na Gi onwe-gi ziterem. 22 Otuto nke I nyeworom ka Mu onwem nyewo-kwa-ra ha; ka ha we buru otù, dika Ayi onwe-ayi bu otù; 23 Mu onwem nime ha, Gi onwe-gi kwa nimem, ka ewe me ka ha buru ndi zuworo okè ibu otù; ka uwa we mara na Gi onwe-gi ziterem, na I hu-kwa-ra ha n'anya, dika I hurum n'anya. 24 Nna, ihe I nyeworom, anamachọ ka, ebe Mu onwem nọ, ka Mu na ndi ahu nọ kwa; ka ha we hu otutom, nke I nyeworom: n'ihi na I hurum n'anya mb͕e akātọghi ntọ-ala uwa. 25 Nna Nke bu Onye ezi omume, uwa amaghi Gi, ma Mu onwem mara Gi; ndia ndia ma-kwara na Gi onwe-gi ziterem; 26 eme-kwa-ram ka ha mara aha-Gi, M'gēme kwa ka ha mara ya; ka ihu-n'anya I ji hum we di nime ha, Mu onwem kwa nime ha.

Jọn 18

1 Mb͕e Jisus kwusiri okwu ndia, Ọ pua, Ya na ndi nēso uzọ-Ya, gabiga n'ofè iyi Kidron, ebe ubi ab͕ara ogige di, nke Ọ bàra nime ya, Ya onwe-ya na ndi nēso uzọ-Ya. 2 Ma Judas, onye nārara Ya nye, mata-kwa-ra ebe ahu: n'ihi na Jisus na ndi nēso uzọ-Ya zukọrọ n'ebe ahu ọtutu oge. 3 Ya mere Judas, ebe ọ natara òtù ndi-agha, na ndi nēje ozi site n'aka ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi, ọ chiri oriọna na ọwa na ihe-agha bia n'ebe ahu. 4 Ya mere Jisus, ebe Ọ matara ihe nile nābiakwasi Ya, Ọ pua, si ha, Ònye ka unu nāchọ? 5 Ha zara Ya, si, Jisus Onye Nazaret. Jisus siri ha, Mu onwem bu Ya. Ma Judas, onye nārara Ya nye, nēguzo kwa n'etiti ha. 6 Ya mere mb͕e Ọ siri ha, Mu onwem bu Ya, ha la azu, we da n'ala. 7 Ya mere Ọ juru ha ọzọ, si, Ònye ka unu nāchọ? Ha si, Jisus Onye Nazaret. 8 Jisus zara, si, Agwaram unu na Mu onwem bu Ya: ya mere ọ buru na unu nāchọm, ka ndia la: 9 ka okwu O kwuru we mezu, si, N'etiti ndi I nyeworom ọ dighi onye ọ bula M'tufuru. 10 Ya mere Saimon Pita, ebe o ji mma-agha, ọ miputa ya, b͕ue orù onye-isi-nchu-àjà mma, bipu nti aka-nri ya. Ma aha orù ahu bu Malkọs. 11 Ya mere Jisus siri Pita, Miye mma-agha-gi n'ọbọ-ya: iko nke Nnam nyeworom, M'gaghi-aṅu ya? 12 Ya mere òtù ndi-agha ahu na ọchi-agha, na ndi nējere ndi-Ju ozi, jidere Jisus ke kwa Ya ab͕u, 13 we buru uzọ duru Ya jekuru Anas; n'ihi na ya bu nna nwunye Kaiafas, onye bu onye-isi-nchu-àjà arọ ahu. 14 Ma Kaiafas bu onye ahu nke dururi ndi-Ju ọdú, na ọ bara urù ka otù onye nwua n'ọnọdu ndi-Ju. 15 Saimon Pita we so Jisus, ya na onye ọzọ nke nēso uzọ Jisus. Ma onye ahu nke nēso uzọ Jisus bu onye onye-isi-nchu-aja mara, o we so Jisus ba n'obí onye-isi-nchu-àjà; 16 ma Pita nēguzo n'èzí n'ọnu-uzọ. Ya mere onye ọzọ ahu nke nēso uzọ Jisus, onye onye-isi-nchu-àjà mara, we pua gwa nwanyi nke nēche ọnu-uzọ okwu, we dubata Pita. 17 Ya mere nwa-ab͕ọghọ ahu nke nēche ọnu-uzọ si Pita, Ọ̀ gābu na gi onwe-gi bu kwa otù onye n'etiti ndi nēso uzọ Nwoke a? Pita si, Abughi m. 18 Ma ndi-orù na ndi nēje ozi guzoro n'ebe ahu, ebe ha funwusiri ọku icheku; n'ihi na oyi nātu; ha nānya kwa ọku: Pita nọ kwa n'etiti ha, nēguzo nānya kwa ọku. 19 Ya mere onye-isi-nchu-àjà juru Jisus ajuju bayere ndi nēso uzọ-Ya, na ajuju bayere ozizí-Ya. 20 Jisus zara ya, si, Mu onwem agwawawo uwa okwu; Mu onwem zíri ihe mb͕e nile n'ulo-nzukọ, na n'ulo uku Chineke, ebe ndi-Ju nile nāb͕akọ; ekwukwaghi m ihe ọ bula na nzuzo. 21 Gini mere i nāju Mu onwem? jua ndi nuworo okwum, ihe M'gwara ha: le, ndia matara ihe nile Mu onwem kwuru. 22 Ma mb͕e O kwusiri okwu ndia, otù onye nime ndi nēje ozi nke nēguzo nso we pia Jisus ihe, si, Ì nāza onye-isi-nchu-àjà otú a? 23 Jisus zara ya, si, Ọ buru na M'kwuru nke-ọjọ, b͕ara ihe ọjọ ahu àmà: ma ọ buru nke-ọma, gini mere i nētim aka? 24 Ya mere Anas zigara Ya n'ab͕u jekuru Kaiafas onye-isi-nchu-àjà. 25 Ma Saimon Pita nēguzo nānya kwa ọku. Ya mere ha siri ya, Ọ̀ gābu na gi onwe-gi bu kwa otù onye nime ndi nēso uzọ-Ya? Onye ahu gọrọ, si, Abughi m. 26 Otù onye nime ndi-orù onye-isi-nchu-àjà, buri onye-ikwu nke onye ahu Pita bipuru nti-ya, si, Mù onwem ahughi gi na Ya n'ubi ahu ab͕ara ogige? 27 Ya mere Pita gọ-kwa-ra ọzọ: ngwa ngwa oke-ọkuku we kwa. 28 Ya mere ha si na nke Kaiafas duru Jisus ba na Pritoriọm: ọ bu kwa n'isi-ututu; ma ha onwe-ha abàghi nime Pritoriọm ahu, ka aghara imeru ha, kama ka ha we rie oriri ngabiga. 29 Ya mere Pailat pukuru ha n'èzí, si, Ọ̀ bu ebubo gini ka unu nēbo Nwoke a? 30 Ha zara, si ya, Ọ buru na Onye a abughi onye nēme ihe ọjọ, ayi agaghi-ararawori Ya nye n'aka-gi. 31 Ya mere Pailat siri ha, Unu onwe-unu were Ya, kpe-kwa-nu Ya ikpé dika iwu-unu si di. Ndi-Ju siri ya, O zighi ayi ezi n'iwu ib͕u onye ọ bula: 32 ka okwu Jisus we mezu, nke O kwuru, nēgosi aha ọnwu Ọ gajē inwu. 33 Ya mere Pailat bà-kwa-ra ọzọ nime Pritoriọm, we kpọ Jisus, si Ya, Gì onwe-gi bu Eze ndi-Ju? 34 Jisus zara, si, Gì onwe-gi nēkwu nka n'onwe-gi, ma-ọbu na ndi ọzọ gwara gi okwu bayerem? 35 Pailat zara, si, Mù onwem bu onye-Ju? Mba nke Gi na ndi-isi-nchu-àjà rara Gi nye n'akam: gini ka I mere? 36 Jisus zara, si, Ala-ezem esiteghi n'uwa nka: ọ buru na ala-ezem sitere n'uwa nka, ndi nējerem ozi gālu ọ̀gù, ka aghara iraram nye n'aka ndi-Ju: ma ub͕u a ala-ezem esighi n'ebe a puta. 37 Ya mere Pailat siri Ya, Gì onwe-gi bu kwa eze? Jisus zara, si, Gi onwe-gi nāsi na Mu onwem bu eze. Amuwo Mu onwem ime ihe a, abiawokwam nime uwa ime ihe a, ka M'we b͕ara ezi-okwu àmà. Onye ọ bula nke sitere n'ezi-okwu ahu nānu olum. 38 Pailat si Ya, Gini bu ezi-okwu? Mb͕e o kwusiri nka, o we pukuru ndi-Ju ọzọ, si ha, Mu onwem ahughi ihe kwesiri ahuhu-nmehie nime Ya. 39 Ma unu nwere ome-n'ala, ka m'rapuru unu otù onye n'ememe ngabiga: ùnu nēzube kwa ka M'rapuru unu Eze ndi-Ju? 40 Ya mere ha tiri nkpu ọzọ, si, Ọ bughi Onye a, kama ọ bu Barabas. Ma Barabas bu onye nāpunara madu ihe.

Jọn 19

1 Ya mere mb͕e ahu Pailat were Jisus, pia Ya ihe. 2 Ndi-agha we kpa okpu-eze nke eji ogwu me, ha were ya kpube Ya n'isi, were kwa uwe odobo b͕okwasi Ya; 3 ha we nābiakute Ya, nāsi, Ekele, Eze ndi-Ju! ha nāpia kwa Ya ihe. 4 Pailat we pu kwa ọzọ n'èzí, si ha, Le, anamekuputa Ya n'èzí nye unu, ka unu we mara na ahughim ihe kwesiri ahuhu-nmehie nime Ya. 5 Ya mere Jisus putara n'èzí, nēkpu okpu-eze ahu nke eji ogwu me, nēyi kwa uwe odobo ahu. Pailat we si ha, Le, Nwoke ahu! 6 Ya mere mb͕e ndi-isi-nchu-àjà na ndi nēje ozi huru Ya, ha tie nkpu, si, Kpọgide Ya n'obe, kpọgide Ya n'obe. Pailat si ha, Unu onwe-unu were Ya, kpọgide kwa Ya n'obe: n'ihi na mu onwem ahughi ihe kwesiri ahuhu-nmhie nime Ya. 7 Ndi-Ju zara ya, si, Ayi onwe-ayi nwere iwu, ma dika iwu ahu si di O kwesiri inwu ọnwu, n'ihi na O mere Onwe-ya Ọkpara Chineke. 8 Ya mere mb͕e Pailat nuru okwu a, ọ tukariri egwu; 9 o we ba nime Pritoriọm ọzọ, we si Jisus, Òle ebe Gi onwe-gi si bia? ma ọ dighi ọziza Jisus zara ya. 10 Ya mere Pailat si Ya, Ì dighi-agwam okwu? Ì mataghi na m'nwere ike irapu Gi, m'nwe-kwa-ra ike ikpọgide Gi n'obe? 11 Jisus zara ya, si, I gaghi-enwe ike ọ bula imegidem, ọ buru na esighi n'elu nye gi ya-ri: n'ihi nka onye raram nye n'aka-gi nwere nmehie kari. 12 Site na nka Pailat nāchọ uzọ irapu Ya: ma ndi-Ju tiri nkpu, si, Ọ buru na i rapu Onye a, i bughi eyì Sisa: onye ọ bula nke nēme onwe-ya eze nēkwu okwu imegide Sisa. 13 Ya mere mb͕e Pailat nuru okwu ndia, o duputa Jisus n'èzí, we nọkwasi oche-ikpé n'ebe anākpọ Pavement, ma n'asusu Hibru, Gabata. 14 Ma ọ bu ubọchi Nkwadebe nke ememe ngabiga: ọ di ka oge hour nke-isi. O we si ndi-Ju, Le, Eze-unu! 15 Ya mere ndi ahu tiri nkpu, si, Wepu Ya, wepu Ya, kpọgide Ya n'obe. Pailat si ha, M'gākpọgide Eze-unu n'obe? Ndi-isi-nchu-àjà zara, si, Ayi enweghi eze ma-ọbughi Sisa. 16 Ya mere mb͕e ahu ọ rara Ya nye n'aka-ha, ka ewe kpọgide Ya n'obe. 17 Ya mere ha kuru Jisus tiyere onwe-ha: O we pua, nēbu obe-Ya n'Onwe-ya, ga rue ebe anākpọ Ebe okpokoro-isi, nke anākpọ n'asusu Hibru Gọlgọta: 18 ebe ha kpọgidere Ya n'obe, Ya na ndikom abua ọzọ, otù n'akuku a otù n'akuku ọzọ, Jisus nọ kwa n'etiti ha. 19 Pailat we de kwa ihe-ndekwasi, debe ya n'elu obe-Ya. Ma ihe edeworo bu, Jisus ONYE NAZARET EZE NDI-JU. 20 Ya mere ọtutu n'etiti ndi-Ju guru ihe-ndekwasi ahu: n'ihi na ebe akpọgidere Jisus n'obe di obodo Jerusalem nso: ede-kwa-ra ya n'asusu Hibru, n'asusu Latin, n'asusu Grik. 21 Ya mere ndi-isi-nchu-àjà nke ndi-Ju si Pailat, Edela, Eze ndi-Ju; kama, na Onye ahu siri, Abum Eze ndi-Ju. 22 Pailat zara, si, Ihe m'deworo, edewom ya. 23 Ya mere ndi-agha, mb͕e ha kpọgidesiri Jisus n'obe, ha chiri uwe-Ya, kè ha òkè anọ, otù onye otù òkè otù onye otù òkè; ha chi-kwa-ra uwe-ime-Ya: ma uwe-ime ahu enweghi ọb͕ub͕a, akpara ya site n'elu we gazu n'aru uwe-ime ahu dum. 24 Ya mere ha siritara onwe-ha, Ka ayi ghara idọwa ya, kama ka ayi fere ya nzà, onye ọ gābu nke ya: ka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ we mezue, nke si, Ha kère uwem nye onwe-ha, N'elu ihe m'nēyi n'aru ka ha fe-kwa-ra nzà. Ya mere ndi-agha ahu mere ihe ndia. 25 Ma nne-Ya, na nwa-nne nne-Ya nke nwayi, Meri nwunye Klopas, na Meri Magdalini, nēguzo obe Jisus nso. 26 Ya mere mb͕e Jisus huru nne-Ya, na onye ahu nke nēso uzọ-Ya, onye Ọ huru n'anya, ka o nēguzo nso, Ọ si nne-Ya, Nwanyi, le, nwa-gi nwoke! 27 Mb͕e ahu Ọ si onye ahu nke nēso uzọ-Ya, Le, nne-gi! Site n'oge hour ahu onye ahu nke nēso uzọ-Ya we kuru ya la n'ulo nke aka ya. 28 Mb͕e ihe a gasri, Jisus, ebe Ọ matara na ihe nile agwuwo ub͕u a, ka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ we mezu, Ọ si, Akpiri nākpọm nku. 29 Adọbara n'ebe ahu ite nke manya-vine b͕ara uka juru: ya mere ha were sponge nke manya-vine ahu b͕ara uka juru tukwasi n'elu osisi hyssop, che Ya n'ọnu. 30 Ya mere mb͕e Jisus narasiri manya-vine ahu nke b͕ara uka, Ọ siri, Ọ gwuwo O we rube isi, rara mọ-Ya nye. 31 Ya mere ndi-Ju, ebe ọ bu ubọchi Nkwadebe, ka aru-ha we ghara idigide n'elu obe n'ubọchi-izu-ike (n'ihi na ubọchi-izu-ike nke ízù ahu bu oké ubọchi), ha kpere Pailat ka etijie ogwe-ukwu-ha, ka ebupu kwa ha. 32 Ya mere ndi-agha biara, tijie ogwe-ukwu nke onye mbu, na nke onye ọzọ, nke akpọgidere Ya na ya n'obe: 33 ma mb͕e ha biaruru Jisus, hu kwa na Ọ nwuwori ub͕u a, ha etijighi ogwe-ukwu-Ya: 34 otú ọ di, otù onye n'etiti ndi-agha were ube ma Ya n'akuku, ngwa ngwa ọbara na miri we puta. 35 Onye huworo ya ab͕awo kwa àmà, àmà-ya bu kwa ezie: onye ahu nāmata kwa na o nēkwu ezi-okwu, ka unu onwe-unu we kwere kwa. 36 N'ihi na ihe ndia mere, ka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ we mezu, Agaghi-etiji otù ọkpukpu-Ya. 37 Ọzọ kwa, ihe ọzọ di iche edeworo n'akwukwọ nsọ si, Ha gēlegide Onye ahu Nke ha mapúru amapú. 38 Ma mb͕e ihe ndia gasiri, Josef nke Arimatia, ebe o nēso uzọ Jisus, ma na nzuzo n'ihi egwu ndi-Ju, o kpere Pailat ka o bupu aru Jisus: Pailat we kwere ya. Ya mere ọ biara, bupu aru-Ya. 39 Nikọdimọs, onye biakutere Ya n'abali na mbu, bia-kwa-ra, nēweta myrrh na aloes agwara, ihe ra ka ọgu pound ise n'ọtùtù. 40 Ya mere ha were aru Jisus, ke ya n'ezi ákwà-ozu, ya na udá utọ ndia, dika ndi-Ju nēme n'ilì ozu. 41 Ma n'ebe akpọgidere Ya N'obe otù ubi ab͕ara ogige di; nime ubi ab͕ara ogige ahu ílì ọhu di kwa nke akātọb͕ọghi madu ọ bula nime ya. 42 Ya mere n'ebe ahu, n'ihi ubọchi Nkwadebe nke ndi-Ju, (n'ihi na ílì ahu di nso), ka ha tọb͕ọrọ Jisus.

Jọn 20

1 Ma n'ubọchi mbu nke ízù ubọchi asa n'isi-ututu, mb͕e chi akābọghi, Meri Magdalini biaruru ílì ahu, we hu nkume-ya na ewepuwo ya n'ílì. 2 Ya mere ọ b͕a ọsọ, biakute Saimon Pita, biakute kwa onye ọzọ ahu nēso uzọ Jisus, onye Jisus huru n'anya, si ha, Ha ebupuwo Onye-nwe-ayi n'ílì, ayi amataghi kwa ebe ha tọb͕orọ Ya. 3 Ya mere Pita puru, ya na onye ọzọ ahu nke nēso uzọ Jisus, ha we nēje iru ílì ahu. 4 Ha abua we b͕a ọsọ n'otù: onye ọzọ ahu nke nēso uzọ Jisus we b͕a kari Pita, buru uzọ biarue ílì ahu; 5 o we ruru ala nyo nime ya, hu ezi ákwà-ozu ahu ka ha tọb͕ọrọ; otú ọ di, ọ bàghi nime. 6 Ya mere Saimon Pita bia kwa nēso ya, o we ba nime ílì ahu; o we hu ezi ákwà-ozu ahu ka ha tọb͕ọrọ, 7 ichafọ kwa, nke diri n'isi-Ya, ya na ezi ákwà-ozu ahu atọb͕ọghi n'otù ebe, kama aturuworo ya debe n'otù ebe di iche. 8 Ya mere mb͕e ahu onye ọzọ ahu nke nēso uzọ Jisus, onye buru uzọ biarue ílì, bà-kwa-ra nime, o we hu, kwere kwa. 9 N'ihi na ha akāmataghi ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, na Ọ ghaghi isi na ndi nwuru anwu bilie. 10 Ya mere ndi ahu ndi nēso uzọ Jisus laghachiri ọzọ n'ulo nke aka ha. 11 Ma Meri nēguzo n'èzí na nso ílì ahu nākwa ákwá: ya mere, ka ọ nākwa, o ruru ala nyo nime ílì; 12 o we hu ndi-mọ-ozi abua nēyi uwe ọcha ka ha nọduru ala, otù n'isi, otù kwa n'ukwu, n'ebe atọb͕ọrọri aru Jisus. 13 Ndi ahu we si ya, Nwanyi, gini mere i nākwa ákwá? Ọ si ha, N'ihi na ha bupuru Onye-nwem, amatakwaghm ebe ha tọb͕ọrọ Ya. 14 Mb͕e o kwusiri okwu ndia, o chigharia, we hu Jisus ka O guzoro, ma ọ mataghi na ọ bu Jisus. 15 Jisus si ya, Nwanyi, gini mere i nākwa ákwá? ònye ka i nāchọ? Nwanyi ahu, ebe ọ nēchè na Ọ bu onye-nche ubi ahu ab͕ara ogige, ọ si Ya, Onye-nwe-ayi, ọ buru na Gi onwe-gi bupuru Ya, gwam ebe I tọb͕ọrọ Ya, mu onwem gēbupu kwa ya. 16 Jisus si ya, Meri. Nwayi ahu chigharia, si Ya n'asusu Hibru, Rabonai; nke bu, Onye-ozizí. 17 Jisus si ya, Emetulam aka; n'ihi na akāmarigogh lakuru Nnam: ma gakwuru umu-nnam, si ha, Anamarigo lakuru Nnam na Nna-unu, na Chinekem na Chineke-unu. 18 Meri Magdalini bia kọrọ ndi nēso uzọ-Ya, si, Ahuwom Onye-nwe-ayi; ọkọ-kwa-ra ha otú Ọ gwara ya-ri ihe ndia. 19 Ya mere mb͕e o ruru anyasi, n'ubọchi ahu, bú ubọchi mbu n'ízù, mb͕e emechi-kwa-ra uzọ nile ebe ndi nēso uzọ-Ya nọ, n'ihi egwu ndi-Ju, Jisus biara guzo n'etiti, si ha, Udo diri unu. 20 Mb͕e O kwusiri nka, O gosi ha aka-Ya abua na akuku-Ya. Ya mere ndi nēso uzọ-Ya ṅuriri ọṅu, mb͕e ha huru Onye-nwe-ayi. 21 Ya mere Jisus siri ha ọzọ, Udo diri unu: dika Nnam ziteworom, otú a ka Mu onwem nēziga kwa unu. 22 Mgbe, ahu o kusa ha ume, si ha, Naranu Mọ Nsọ: 23 ndi nile ọ bula unu nāb͕aghara nmehie-ha, ab͕agharawo ha nye ha; ndi nile ọ bula unu nējide nmehie-ha, ejidewo nmehie-ha. 24 Ma Tomas, nke anākpọ Didimọs, otù onye nime ndi-ozi iri na abua ahu, anọghi n'etiti ha mb͕e Jisus biara. 25 Ya mere ndi ọzọ nēso uzọ Jisus si ya, Ayi ahuwo Onye-nwe-ayi. Ma ọ siri ha, Ọ buru na ahughm n'aka-Ya abua apa ǹtú, tiye kwa nkpisi-akam n'apa ǹtú ahu, tiye kwa akam n'akuku-Ya, m'gaghi-ekwe ma-ọli. 26 Mb͕e ubọchi asatọ ọzọ gasiri ndi nēso uzọ Jisus we nọ nime ulo, Tomas nọ kwa n'etiti ha. Jisus bia, mb͕e emechiri uzọ nile, O guzo n'etiti ha, si, Udo diri unu. 27 Mb͕e ahu Ọ si Tomas, Setipu nkpisi-aka-gi n'ebe a, le akam abua; setipu kwa aka-gi, tiye nime akukum: aghọ-kwa-la onye nēkweghi, kama ghọ onye nēkwere. 28 Tomas zara, si Ya, Onye-nwem na Chinekem. 29 Jisus si ya, N'ihi na i huwom, ì kwerewo? ngọzi nādiri ndi akāhughi, ma ha kwere. 30 Ya mere ọtutu ihe-iriba-ama ọzọ ka Jisus mere n'iru ndi nēso uzọ-Ya, nke anēdeghi n'akwukwọ a: 31 ma edewo ihe ndia n'akwukwọ, ka unu we kwere na Jisus bu Kraist ahu, Ọkpara Chineke; ka unu we nwe kwa ndu n'aha-Ya n'ihi na unu kwere.

Jọn 21

1 Mb͕e ihe ndia gasiri Jisus mere Onwe-ya ka Ọ puta ìhè ọzọ nye ndi nēso uzọ-Ya n'oké osimiri Taibirias; ma O mere Onwe-ya ka Ọ puta ìhè otú a. 2 Saimon Pita, na Tomas anākpọ Didimọs, na Nataniel, bú onye Kena nke Galili, na umu nke Zebedi, na madu abua ọzọ nime ndi nēso uzọ-Ya, nọkọrọ n'otù ebe. 3 Saimon Pita si ha, Anamaga ib͕u azù. Ha si ya, Ayi onwe-ayi gēso kwa gi je. Ha puru, ba n'ub͕ọ-ha; ma n'abali ahu ha egbughi ihe ọ bula. 4 Ma mb͕e chi nābọ ub͕u a, Jisus guzoro n'ótú: otú ọ di, ndi nēso uzọ-Ya amataghi na ọ bu Jisus. 5 Ya mere Jisus si ha, Umu-ntakiri, ùnu ji ihe-oriri ọ bula? Ha zara Ya, si, É-è. 6 O we si ha, Wuyenu ihe unu ji eb͕u azù n'akuku aka-nri nke ub͕ọ, unu gāhu kwa. Ya mere ha wuyere ya, ma ub͕u a ha enweghi ike idọ ya n'ihi ọtutu azù di ya. 7 Ya mere onye ahu nke nēso uzọ-Ya onye Jisus huru n'anya siri Pita, Ọ bu Onye-nwe-ayi. Ya mere mb͕e Saimon Pita nuru na ọ bu Onye-nwe-ayi, o b͕okwasi uwe uku ya (n'ihi na ọ b͕ara ọtọ), we tubà onwe-ya nime oké osimiri. 8 Ma ndi ọzọ ndi nēso uzọ Jisus biara n'ub͕ọ ntà ha (n'ihi na ha anọghi n'ebe di anya n'ala, kama ihe ra ka ọgu cubit iri), nādọ ihe ha ji eb͕u azù nke azù juru nime ya. 9 Ya mere mb͕e ha ridara n'ala, ha hu ọku icheku n'ebe ahu, na azù atukwasiri ya, na ob͕e achicha. 10 Jisus si ha, Wetanu ufọdu nime azù unu b͕uru ub͕u a. 11 Ya mere Saimon Pita rigoro, dọrọ ihe ha ji eb͕u azù bia n'ala, nke oké azù juru nime ya, ọgu azù asa na iri na atọ: ma ọ bu ezie na azù di ọtutu otú a, ma ihe ha ji eb͕u azù adọkaghi. 12 Jisus si ha, Bianu, rie nri-ututu. Ma ọ dighi onye ọ bula nime ndi nēso uzọ-Ya nwere anya-ike iju Ya, si, Gì onwe-gi bu onye? n'ihi na ha matara na ọ bu Onye-nwe-ayi. 13 Jisus bia, were achicha ahu, nye ha, azù ahu kwa otú ahu. 14 Nka mere ya ub͕ò atọ emere ka Jisus puta ìhè nye ndi nēso uzọ-Ya, mb͕e emesiri ka O si na ndi nwuru anwu bilie. 15 Ya mere mb͕e ha risiri nri-ututu-ha, Jisus si Saimon Pita, Saimon, nwa Jọn, ì hurum n'anya kari ndia? Ọ si Ya, E, Onye-nwe-ayi; Gi onwe-gi matara na I bu eyìm. Ọ si ya, Nēnye umu-aturum nri. 16 Ọ si ya ọzọ nke ub͕ò abua, Saimon, nwa Jọn, ì hurum n'anya? Ọ si Ya, E, Onye-nwe-ayi; Gi onwe-gi matara na I bu eyìm. Ọ si ya, Nāzù aturum. 17 Ọ si ya nke ub͕ò atọ, Saimon, nwa Jọn, àbum eyì-gi? O wutara Pita na Ọ siri ya nke ub͕ò atọ, Àbum eyì-gi? O we si Ya, Onye-nwe-ayi, Gi onwe-gi matara ihe nile; Gi onwe-gi mara na I bu eyìm. Jisus si ya, Nēnye aturum nri. 18 N'ezie, n'ezie, asim i, Mb͕e i di n'okorọbia, i nēke onwe-gi ihe-ọkiké n'úkwù, nējeghari kwa ebe i nāchọ: ma mb͕e i gēme agadi, i gēseti aka-gi abua, onye ọzọ gēke gi ihe-ọkiké n'úkwù, būru kwa gi ga ebe i nāchọghi. 19 Ma nka ka O kwuru, nēgosi aha ọnwu ọ gēji nye Chineke otuto. Mb͕e O kwusiri nka, Ọ si ya, Som. 20 Pita we chigharia, hu onye ahu nke nēso uzọ-Ya, onye Jisus huru n'anya, ka o nēso; onye nādabere kwa n'obi-Ya na nri-anyasi ahu, si, Onye-nwe-ayi, ònye bu onye ahu nke nārara Gi nye? 21 Ya mere Pita, mb͕e ọ huru ya, ọ si Jisus, Onye-nwe-ayi, ma onye a, gini gēme ya? 22 Jisus si ya, Ọ buru na anamachọ ka ọ nọgide rue mb͕e M'gābia, ọ̀ bu gini n'ebe i nọ? gi onwe-gi som. 23 Ya mere okwu a putara n'etiti umu-nna nime Kraist, na onye ahu nke nēso uzọ-Ya agaghi-anwu: ma Jisus asighi ya, na ọ gaghi-anwu; kama, Ọ buru na anamachọ ka ọ nọgide rue mb͕e M'gābia, ọ̀ bu gini n'ebe i nọ? 24 Nka bu onye ahu nēso uzọ Jisus nke nāb͕ara ihe ndia àmà, nke de-kwa-ra ihe ndia n'akwukwọ: ayi mata-kwa-ra na àmà-ya bu ezie. 25 Ma ọtutu ihe ọzọ nke Jisus mere di kwa, nke, ma ọ buru na edere ha n'akwukwọ n'otù n'otù, ọ dim ka ọbuná uwa onwe-ya agaghi-anagide akwukwọ agēde.

Ọlu Ndi-Ozi 1

1 Ederem akwukwọ mbu, Teofilọs, banyere ihe nile Jisus malitere ime na izí, 2 rue ubọchi anara Ya n'elu, mb͕e O sitere na Mọ Nsọ nyesia ndi-ozi-Ya ndi Ọ rọputarari iwu: 3 ndi O ji kwa ọtutu uzọ nādighi igọ agọ che Onwe-ya n'iru ha na ndu mb͕e Ọ husiri ahuhu, ebe O mere ka ha nāhu Ya anya n'ogologo ọgu ubọchi abua, O nēkwu kwa ihe nile bayere ala-eze Chineke: 4 mb͕e Ya na ha zukọrọ O we nye ha iwu ka ha ghara isi na Jerusalem pua, kama ka ha chere nkwa nke Nna-Ya, nke unu nuru n'ọnum, ka O kwuru: 5 n'ihi na Jọn jiri miri me baptism n'ezie; ma agēji Mọ Nsọ me unu baptism mb͕e ọtutu ubọchi nāgaghi-agabiga site n'ub͕u a. 6 Ya mere mb͕e ha b͕akọrọ, ha jua Ya, si, Onye-nwe-ayi, ọ̀ bu n'oge a ka I nēnyeghachi Israel ala-eze? 7 O we si ha, Ọ bughi ihe diri unu ima oge ma-ọbu ubọchi, nke Nnam debere n'ike nke aka Ya. 8 Ma unu gānata ike, mb͕e Mọ Nsọ gābiakwasiwori unu: unu gābu kwa ndi-àmàmnime Jerusalem, na nime Judia na Sameria nile, ru kwa ebe uwa sọturu. 9 Mb͕e O kwusiri okwu ndia, mb͕e ha nēle anya, ewe welie Ya elu; igwe-oji we nara Ya, Ọ pua n'anya-ha. 10 Mb͕e ha nēlegide anya n'elu-igwe ka Ọ nāga n'elu, le, ndikom abua we guzo ha nso yiri uwe ọcha; 11 ndi si-kwa-ara, Ndikom nke Galili, gini mere unu nēguzo nēle anya n'elu-igwe? Jisus nka, Onye anapuru n'ebe unu nọ rigo n'elu-igwe, gābia n'otù aka ahu dika unu kiriri Ya ka Ọ nāga n'elu-igwe. 12 Mb͕e ahu ha siri n'ugwu anākpọ Olivet, nke di Jerusalem nso, ije nke otù ubọchi-izu-ike, laghachi na Jerusalem. 13 Mb͕e ha batara n'obodo, ha we rigo n'ime-ulo di n'elu ulo, ebe ha nānọ; Pita na Jọn na Jemes na Andru, Filip na Tomas, Batọlọmiu na Matiu, Jemes nwa Alfiọs, na Saimon Zilotis, na Judas nwa Jemes. 14 Ndia nile ji otù obi nọgidesi ike n'ekpere, ha na ndinyom ufọdu, na Meri nne Jisus, na umu-nne-Ya. 15 Na mb͕e ahu Pita we bilie n'etiti umu-nna nime Kraist, si, (ìgwè madu ndi nọkọrọ n'otù di kwa, ihe ra ka ọgu madu isi), 16 Umu-nnam, ihe edeworo n'akwukwọ nsọ aghaghi imezu, nke Mọ Nsọ kwuru n'oge gara aga site n'ọnu Devid banyere Judas, onye mesiri buru onye-ndù ndi jidere Jisus. 17 N'ihi na aguru ya-ri n'etiti ayi, o we keta òkè-ya n'ije-ozi a. 18 (Ya mere onye a sitere n'ugwọ-ọlu nke ajọ omume-ya nata otù iberibe ala; o we da su isi n'ala, tipue afọ-ya, ngiri-afọ-ya nile we nuputa. 19 Ọ we buru ihe ndi nile bi na Jerusalem mara; ya mere eji akpọ iberibe ala ahu Akeldama n'asusu-ha, nke ahu bu, Iberibe ala ọbara. ) 20 N'ihi na edewo ya n'akwukwọ Abù ọma, si, Ka ebe-ulo-ikwū-ya ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, Ka onye ọ bula ghara kwa ibi na ya: na, Ka onye di iche nara ya ọlu-nlekọta-ya. 21 Ya mere otù onye nime ndikom ndi soro ayi n'oge nile Onye-nwe-ayi Jisus bàra nime pu kwa n'èzí n'etiti ayi, 22 nāmalite na baptism nke Jọn, rue ubọchi anapuru Ya n'ebe ayi nọ rigo n'elu-igwe, otù onye nime ndia aghaghi iso ayi buru onye-àmà nke nbilite- n'ọnwu-Ya. 23 Ha we guzo madu abua, Josef anākpọ Basabas, onye akpọ-kwa-ra Justọs, na Mataias. 24 Ha we kpe ekpere, si, Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi, Onye mara obi madu nile, gosi ayi onye ahu I rọputara nime madu abua ndia, 25 inara ọnọdu n'ije-ozi na ọlu onye-ozi a, nke Judas jehiere nime ya, ka o we ga n'ebe nke aka ya. 26 Ha we fere ha nzà; nzà ahu we ma Mataias; ewe gua ya nime ndi-ozi iri na otù ahu.

Ọlu Ndi-Ozi 2

1 Mb͕e ubọchi Pentikọst nēzu okè, ha nile we nọkọ n'otù ebe. 2 Na mberede ùzù, dika nke oké ifufe nke nēfesi ike, we site n'elu-igwe, o we juputa ulo ahu dum ebe ha nānọdu ala. 3 Ewe me ka ha hu ire, dika nke ọku, nēkesa onwe-ha; o we nọkwasi ha nile n'otù n'otù. 4 Ha nile we juputa na Mọ Nsọ, ha we malite ikwu okwu n'asusu di iche, dika Mọ ahu nēnye ha ike ikwuwa okwu. 5 Ma ndi-Ju ufọdu bi na Jerusalem, ndi nātu egwu Chineke, ndi si na mba nile di n'okpuru elu-igwe bia. 6 Ma mb͕e ùzù ahu putura, ọra madu b͕akọrọ, o we b͕a ha ghari, n'ihi na onye ọ bula n'etiti ha nānu ka ha nēkwu okwu n'asusu nke aka ya. 7 Ibobo we nwua ha nile n'aru, o ju-kwa-ra ha anya, ha si, Le, ndia nile ndi nēkwu okwu, hà abughi ndi Galili? 8 Àyi onwe-ayi si kwa aṅa nu n'otù n'asusu nke aka ayi, nke amuru ayi nime ya? 9 Ndi Patia na ndi Midia na ndi Ilam, na ndi bi na Mesọ-pọtemia, ndi bi kwa nime Judia na Kapa-dọsia, nime Pọntọs na Esia, 10 nime Frijia na Pamafilia, nime Ijipt na akuku Libia di Sairini nso, na ndi-ọbìa si na Rom bia, ma ndi-Ju ma ndi nēso uzọ ndi-Ju, 11 ndi Krit na ndi Arebia, ayi nānu ka ha nēkwu okwu n'asusu-ayi bayere oké ọlu nile nke Chineke. 12 Ibobo we nwua ha nile n'aru, ha nwe-kwa-ra obi abua, nāsirita ibe-ha, Isi ihe a bu gini? 13 Ma ndi ọzọ nēme ha ihe-ọchì, si, Ha ṅujuworo manya-vine ọchu afọ. 14 Ma Pita guzoro, ya na ndi-ozi iri na otù ahu, we welie olu-ya elu, gwawa ha okwu, si, Ndikom nke Judia, na unu nile ndi bi na Jerusalem, maranu nka, ge-kwa-nu nti n'okwum. 15 N'ihi na manya abàghi ndia n'anya, dika unu onwe-unu nēchè; ebe ọ bu oge hour nke-atọ n'ututu; 16 kama nka bu nke ekwuworo site n'ọnu Joel onye-amuma, si, 17 Ọ gēru kwa na mb͕e ikpe-azu, ka Chineke kwuru, M'gāwusa ufọdu nime Mọm n'aru anu-aru nile, bú madu: Umu-unu ndikom na umu-unu ndinyom gēbu kwa amuma, Umu-okorọbia-unu gāhu kwa ọhù, Ndi-okenye-unu gārọ kwa nrọ: 18 E, n'aru ndi-orùm ndikom na n'aru ndi-orùm ndinyomKa M'gāwusa ufọdu nime Mọ nkem na mb͕e ahu; ha gēbu kwa amuma. 19 M'gēnye kwa ọlu-ebube n'elu-igwe di n'elu, Na ihe-iriba-ama n'elu ala di n'okpuru ya; Ọbara, na ọku, na alulu anwuru-ọku: 20 Anyanwu gāb͕anwe ghọ ọchichiri, Ọnwa gāb͕anwe kwa ghọ ọbara, Tutu ubọchi Onye-nwe-ayi abia, Bú oké ubọchi ahu nke nāputa ìhè: 21 O gēru kwa, na onye ọ bula nke gākpọku aha Onye-nwe-ayi, agāzọputa ya. 22 Ndikom nke Israel, nurunu okwu ndia: Jisus Onye Nazaret, bú Nwoke Nke Chineke gosiworo unu site n'ọlu di ike na ọlu-ebube na ihe-iriba-ama, nke Chineke mere site n'aka-Ya n'etiti unu, dika unu onwe-unu matara: 23 Onye a, ebe ewere Ya nye site n'ìzù akara àkà nke Chineke na ọmuma-ihe Chineke buru uzọ mara, Onye a ka unu kpọgidere n'obe b͕u kwa site n'aka ndi nāmaghi iwu-ayi: 24 Onye Chineke mere ka O si n'ọnwu bilie, mb͕e Ọ tọpusiri ihe-nb͕u nke ọnwu: n'ihi na ọnwu apughi ijide Ya. 25 N'ihi na Devid nēkwu okwu bayere Ya, si, Anamahuri Onye-nwe-ayi n'irum mb͕e nile; N'ihi na Ọ nọ n'aka-nrim, ka aghara ime ka M'me nkpatu: 26 N'ihi nka ọ tọrọ obim utọ, obi nātọ kwa irem utọ nke-uku; Ọzọ kwa, anu-arum gēbi kwa n'olile-anya: 27 N'ihi na I gaghi-arapu nkpuru-obim nime Hedis, I gaghi-enye kwa Onye nke Gi di ọcha n'obi ka Ọ hu ire-uré. 28 I mere ka M'mara uzọ ndu; I gēji iru-Gi me ka M'juputa n'ọṅù. 29 Umu-nnam, o ziri ezi iwere nkwuwa-okwu gwa unu okwu bayere nna uku ayi Devid, na ọ nwuru, eli kwa ya, ílì-ya di kwa n'etiti ayi rue ubọchi ta. 30 Ya mere ebe ọ bu onye-amuma, mata kwa na Chineke ṅuru ya-ri iyi, na Ọ gēwere otù Onye nime ndi bu nkpuru si ya n'afọ puta me ka Ọ nọkwasi oche-eze-ya; 31 ebe o buru uzọ hu nka a o kwuru okwu bayere nbilite-n'ọnwu nke Kraist ahu, na arapughi Ya nime Hedis, anu-aru-Ya ahughi kwa ire-uré. 32 Jisus nka ka Chineke mere ka O si n'ọnwu bilie, nke ayi onwe-ayi nile bu ndi-àmà-ya. 33 Ya mere, ebe eweliri Ya elu site n'aka-nri Chineke, ebe Ọ nata-kwa-ra n'aka Nna-Ya nkwà ahu, bú Mọ Nsọ, Ọ wusara nka unu onwe-unu nāhu nānu kwa. 34 N'ihi na Devid arigoghi n'elu-igwe: ma ya onwe-ya si, Onye-nwe-ayi siri Onye-nwem, Nọdu ala n'aka-nrim, 35 Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-Gi ka ihe-nb͕akwasi nke ukwu-Gi abua. 36 Ya mere ka ulo Israel nile mazue, na Chineke mere Ya ka Ọ buru Onye-nwe-ayi na Kraist-ayi, bú Jisus ahu Onye unu onwe-unu kpọgidere n'obe. 37 Ma mb͕e ha nuru nke a, ewe dua ha nime obi-ha, ha we si Pita na ndi-ozi fọduru, Umu-nna-ayi, gini ka ayi gēme? 38 Pita we si ha, Chègharianu, ka eme kwa unu nile baptism n'otù n'otù n'aha Jisus Kraist, ka ewe b͕aghara nmehie nile unu; unu gānata kwa onyinye a, bú Mọ Nsọ. 39 N'ihi na unu ka nkwa nka diri, na umu-unu, na ndi nile nọ n'ebe di anya, ka ha ra, bú ndi Onye-nwe-ayi Chinike-ayi gākpọtara Onwe-ya. 40 O ji kwa ọtutu okwu ọzọ kwusie okwu ike, nāriọ kwa ha, si, Zọputanu onwe-unu n'ọb͕ọ a di nb͕agọ. 41 Ya mere ndi nāra okwu-ya nke-ọma, emere ha baptism: n'ubọchi ahu ewe tukwasiri ha ihe ra ka nnù madu asa na ọgu iri. 42 Ha we nānọgidesi ike n'ozizí ndi-ozi na nnwekọ, n'inyawa-achicha-ha na ekpere-ha. 43 Madu nile we tua egwu n'otù n'otù: eme-kwa-ra ọtutu ọlu-ebube na ihe-iriba-ama site n'aka ndi-ozi. 44 Ndi nile ndi kwere na Kraist nọkọ-kwa-ra, ha nwekọ-kwa-ra ihe nile; 45 ha we re ihe nile ha natara na ihe nile ha nwere, we kesa ha nye madu nile, dika nkpà diri onye ọ bula. 46 Ha ji kwa otù obi nānọgidesi ike n'ulo uku Chineke kwa-ubọchi, ha nānyawa kwa achicha n'ulo-ha, we nara ihe-oriri-ha n'obi utọ na obi nke aghughọ nādighi ya, 47 ha nēto Chineke, ihe-ha nātọ kwa ndi-Ju dum utọ. Onye-nwe-ayi nātukwasi-kwa-ra ha kwa-ubọchi ndi anāzọputa.

Ọlu Ndi-Ozi 3

1 Ma Pita na Jọn nārigo n'ulo uku Chineke n'oge hour ekpere, bù oge hour nke-iteghete. 2 Anēbute kwa otù nwoke nke dara ngwurọ site n'afọ nne-ya, onye ha nātọb͕ọ kwa-ubọchi na nso ọnu-uzọ ahu nke ulo uku Chineke nke anākpọ Ọnu-uzọ Ọma, iriọ onyinye-ebere n'aka ndi nābà nime ulo uku Chineke; 3 onye, mb͕e ọ huru Pita na Jọn ka ha gaje ibà n'ulo uku Chineke, ọ kpe ekpere inata onyinye-ebere. 4 Ma Pita, ka ya na Jọn nēlegide ya anya, ọ si, Le ayi anya. 5 O we riba ha ama, nēle anya inata ihe n'aka-ha. 6 Ma Pita siri, Ọ dighi ọla-ọcha na ọla-edo m'nwere; ma ihe m'nwere, nke ahu ka m'nēnye gi. N'aha Jisus Kraist Onye Nazaret, je ije. 7 O we jide ya n'aka-nri, palie ya: ngwa ngwa ukwu-ya abua na nkwonkwo-ukwu-ya we nwe ume. 8 O we wulie elu, guzo, je kwa ije; o we so ha ba n'ulo uku Chineke, nēje ije, nāwuli kwa, nēto kwa Chineke. 9 Ndi-Ju nile we hu ya ka ọ nēje ije nēto kwa Chineke; 10 ha we mata ya, na ọ bu onye ahu nke nọduru n'Ọnu-uzọ-ama Ọma nke ulo uku Chineke inata onyinye-ebere: o we b͕a ha ghari nke-uku, ibobo nwubiga-kwa-ra ha ókè n'aru, n'ihi ihe emeworo ya-ri. 11 Ma mb͕e o nējide Pita na Jọn aka, ndi-Ju nile b͕akọrọ n'ebe ha nọ n'ìbà nke anākprọ ìbà Solomon, ibobo nwuru ha n'aru nke-uku. 12 Ma mb͕e Pita huru ya, ọ zara ndi-Ju, si, Ndikom nke Israel, gini mere ihe a nēju unu anya? ma-ọbu gini mere unu nēlegide ayi anya, dika ọ bu site n'ike nke aka ayi? ma-ọbu dika ayi onwe-ayi nāsọpuru Chineke ka ayi meworo ya ka ọ je ije? 13 Chineke nke Abraham, na nke Aisak, na nke Jekob, Chineke nke nna-ayi-hà, nyere Onye ahu nējere Ya ozi otuto, bù Jisus; Onye unu onwe-unu rara nye, gọnari kwa n'iru Pailat, mb͕e o kpereri ikpè irapu Ya. 14 Ma unu onwe-unu gọnariri Onye Nsọ na Onye Ezi Omume ahu, we riọ ka ewere amara nye unu ob͕u-madu, 15 unu we b͕ue Onye ahu nke nēdubà madu na ndu; Onye Chineke mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie; Onye ayi onwe-ayi bu ndi-àmà-Ya. 16 Site kwa n'okwukwe ekwere n'aha-Ya ka aha-Ya nyere nwoke a ume, onye unu nēle anya mata kwa: e, okwukwe ahu nke sitere n'aka-Ya mere ka aru-ya dizu nma n'iru unu nile. 17 Ma ub͕u a, umu-nnam, amataram na unu mere ya n'amaghi-ihe, dika ndi-isi-unu me-kwa-ra. 18 Ma ihe nile Chineke buru uzọ kwusa site n'ọnu ndi-amuma-Ya nile, na Kraist-Ya gāhu ahuhu, O mezuru ha otù a. 19 Ya mere chègharianu, chighari-kwa-nu, ka ewe hichapu nmehie nile unu, ka oge inwe ume ndu we si n'iru Onye-nwe-ayi bia otù a; 20 ka O we zite kwa Kraist ahu Onye eburu uzọ rọputara unu, bù Jisus: 21 Onye elu-igwe aghaghi inara nke-ọma rue oge agēme ka ihe nile di ka ha di na mbu, bù oge nke Chineke kwuru okwu bayere ha site n'ọnu ndi-amuma-Ya di nsọ ndi sitere na nmalite oge a. 22 Moses kwuru n'ezie, si, Onye-nwe-ayi Chineke gēme ka Onye-amuma, Nke di ka mu onwem, biliere unu site n'etiti umu-nne-unu; Onye ahu ka unu gēge nti n'ihe nile, ka ha ra, bù nke Ọ gāgwa unu. 23 Ma ọ gēru, na madu ọ bula, nke nāgaghi-ege nti Onye-amuma ahu, agēkpochapu ya n'etiti ndim. 24 E, ndi-amuma nile site na Samuel na ndi soro ya n'azu, ka ha ra, bù ndi kwuru, ha kwusa-kwa-ra okwu banyere ubọchi nda. 25 Unu onwe-unu bu umu ndi-amuma, na umu ọb͕ub͕a-ndu ahu nke Chineke na nna-unu-hà b͕ara, mb͕e Ọ siri Abraham, Ọ bu kwa na Nkpuru-gi ka agāgọzi ab͕uru niile nke uwa. 26 Unu bu ndi Chineke buru uzọ were Ya zitere, mb͕e O mere ka O bilie, bù Onye ahu nējere Ya ozi, igọzi unu, n'ichighari unu nile n'otù n'otù ka unu rapu ajọ ihe-unu.

Ọlu Ndi-Ozi 4

1 Ma mb͕e ha nāgwa ndi-Ju okwu, ndi-nchu-àjà na ọchi-agha nke ulo uku Chineke na ndi-Sadusi biakwasiri ha, 2 ebe ike gwuru ha nọ̄ n'ihi na ha nēzi ndi-Ju ihe, nēkuwsa kwa nime Jisus nbilite site na ndi nwuru anwu. 3 Ha we tukwasi ha aka, tiye ha n'ulo-nkpọrọ rue echi-ya: n'ihi na ọ bu anyasi ub͕u a. 4 Ma ọtutu n'etiti ndi nuru okwu-ha kwere; ọnu-ọgugu ndikom ahu we rue ihe ra ka nnù iri na nnù abua na ọgu iri. 5 O we rue n'echi-ya, na ndi-isi-ha na ndi-okenye-ha na ndi-ode-akwukwọ-ha zukọrọ na Jerusalem; 6 Anas onye-isi-nchu-àjà nọ kwa n'ebe ahu, na Kaiafas, na Jọn, na Aleksanda, na ka ha ra, bú ndi sitere n'ikwu nke onye-isi-nchu-àjà. 7 Mb͕e ha guzosiri ha n'etiti, ha jua ha, si, N'àha ike gini, ma-ọbu n'aha gini, ka unu onwe-unu mere nka? 8 Mb͕e ahu Pita, ebe o juputara na Mọ Nsọ, ọ si ha, Ndi-isi ndi-Ju, na ndi-okenye, 9 ọ buru na ekpe ayi onwe-ayi ta ikpé bayere ọlu ọma aluru n'aru onye aru nādighi ya ike, ihe eji zọputa onye a; 10 ka eme ka unu nile na ndi Israel nile mara, na ọ bu n'aha Jisus Kraist Onye Nazaret, Onye unu onwe-unu kpọgidere n'obe, Onye Chineke mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, ọ bu n'aha nka ka onye a ji aru di nma guzo n'iru unu n'ebe a. 11 Onye ahu bu nkume nke unu, bú ndi nēwu ulo, kpọrọ ihe-efu, nke ghọrọ isi nkuku ulo. 12 Nzọputa adighi kwa n'onye ọ bula ọzọ: n'ihi na aha ọzọ di iche adighi kwa n'okpuru elu-igwe, nke enyeworo n'etiti madu, nke anāghaghi izọputa ayi nime ya. 13 Ma mb͕e ha huru nkwuwa-okwu nke Pita na Jọn, mb͕e ha ghọta-kwa-ra na ha bu ndi nāmaghi ihe na ndi nāmutaghi akwukwọ ri nne, o ju ha anya; ha we mata ha, na ha na Jisus anọwori. 14 Ebe ha hu-kwa-ra nwoke ahu nke emereri ka aru di ya ike ka ya na ha nēguzo, ha enweghi ihe ikwugide ya. 15 Ma mb͕e ha gwasiri ha ka ha si na nnọkọ-ikpé-ha pua n'èzí, ha b͕a ìzù n'etiti onwe-ha, 16 si, Gini ka ayi gēme madu ndia? n'ihi na ọ putara ìhè nye ndi nile bi na Jerusalem, na ọ bu ezie na emewo ihe-iriba-ama amara nke-ọma site n'aka-ha; ayi apughi kwa igọ ya. 17 Ma ka o we ghara ib͕asa kari n'etiti ndi-Ju, ka ayi bara ha nba, ka ha ghara igwa madu ọ bula okwu n'aha nka site n'ub͕u a. 18 Ha we kpọ ha, nye ha iwu ka ha ghara ikwu okwu ma-ọli ma-ọbu izí ihe n'aha Jisus. 19 Ma Pita na Jọn zara, si ha, Kpenu ma ọ bu ihe ziri ezi n'anya Chineke inu olu-unu kari olu Chineke: 20 n'ihi na ayi onwe-ayi apughi ighara ikwu ihe nile ayi huru nu kwa. 21 Ma mb͕e ha basiri ha nba ọzọ, ha rapu ha ka ha la, ebe ha nāhughi uzọ ha gēsi me ka ha hu ahuhu-nmehie, n'ihi ndi-Ju; n'ihi na madu nile nēnye Chineke otuto bayere ihe emeworo. 22 N'ihi na nwoke a b͕ara kari ọgu arọ abua, bú onye emereri ihe-iriba-ama nka n'aru-ya, bú ime ka aru-ya di ike. 23 Ma mb͕e arapusiri ha, ha biakutere ndi nke aka ha, we kọrọ ha ihe nile, ka ha ra, bú nke ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye siri ha-ri. 24 Ma mb͕e ha nuru ya, ha were otù obi welie olu-ha kpọkue Chineke, si, Onye-nwe-ayi, Gi onwe-gi bu Onye kère elu-igwe na ala na oké osimiri, na ihe nile di ha nime: 25 Onye sitere n'aka Mọ Nsọ, site n'ọnu nna-ayi Devid onye nējere Gi ozi, si, N'ìhi gini ka mba nile mere oké nkpọtu, Ndi nile di n'uwa nātughari kwa ihe-efu uche? 26 Ndi-eze uwa guzoro onwe-ha n'otù, Ndi-isi zukọ-kwa-ra, Imegide Onye-nwe-ayi, na imegide Kraist-Ya: 27 n'ihi na ọ bu ezie na nime obodo a Herod na Pọntiọs Pailat, ha na ndi mb͕a ọzọ na ndi Israel nile, zukọrọ imegide Onye Nsọ ahu nējere Gi ozi, bú Jisus, onye I tere manu n'isi, 28 ka ha me ihe nile, ka ha ra, bú nke aka-Gi na ìzù-Gi buru uzọ ka àkà ka ha puta. 29 Ub͕u a, Onye-nwe-ayi, le kwa iba-nba-ha anya: nye kwa ndi-orù-Gi ike ka ha were nkwuwa-okwu nile kwue okwu-Gi, 30 n'iseti aka-Gi ime ka aru madu di ike; ka ewe me kwa ihe-iriba-ama na ọlu-ebube site n'aha Onye Nsọ ahu nējere Gi ozi, bú Jisus. 31 Mb͕e ha riọsiri aririọ, ewe me ka ebe ha nọ na nzukọ me nkpatu; ha nile we juputa na Mọ Nsọ, we were nkwuwa-okwu nēkwu okwu Chineke. 32 Ma ọra ndi kwere na Kraist nwere otù obi na otù nkpuru-obi: ọ dighi kwa otù onye n'etiti ha nāsi na ihe ọ bula nime ihe nile o nwere bu nke aka ya; kama ha nwekọrọ ihe nile. 33 Ọ bu kwa ike uku ka ndi-ozi ji ab͕a àmà-ha bayere nbilite-n'ọnwu nke Onye-nwe-ayi Jisus: oké amara dikwasi-kwa-ra ha nile. 34 N'ihi na ọ dighi kwa onye ọ bula n'etiti ha nkpà nākpà: n'ihi na ka ha ra, bú ndi nwere ala ma-ọbu ulo, ha nēre ha, weta ọnu-ahia nile nke ihe nile erere, 35 tọb͕ọ ha n'ukwu ndi-ozi: ewe nēkè òkè enye ha nile n'otù n'otù, dika ọ di onye ọ bula nkpà. 36 Ma Josef, onye ndi-ozi kpọ-kwa-ra Banabas, (nke bu, ma asugharia ya, Nwa nke nkasi-obi), bú onye Livai, onye Saiprọs n'ọmumu-ya, 37 ebe o nwere ubi, o re ya, weta ego-ya, tọb͕ọ n'ukwu ndi-ozi.

Ọlu Ndi-Ozi 5

1 Ma otù nwoke nke anākpọ aha-ya Ananaias, ya na Safaira nwunye-ya, rere otù ihe o nwere, 2 we debere onwe-ya ufọdu nime ọnu-ahia-ya, nwunye-ya ma-kwa-ra, o we weta otù òkè, tọb͕ọ ya n'ukwu ndi-ozi. 3 Ma Pita siri, Ananaias, n'ìhi gini ka Setan mejuru obi-gi igwa Mọ Nsọ okwu-ugha, na idebere onwe-gi ufọdu nime ọnu-aha nke iberibe ala gi? 4 Mb͕e ọ nānọ, ọ̀ nọgideghi n'aka-gi? mb͕e eresiri ya, ọ̀ dighi kwa n'ike-gi? Gini mere i ji tiye ihe a n'obi-gi? Ọ bughi madu ka i gwara okwu-ugha, kama ọ bu Chineke. 5 Ma mb͕e Ananaias nuru okwu ndia ọ da n'ala, kubìe ume: ndi nile nke nuru ya we tua oké egwu. 6 Ndi bu umu-okorọbia nime ha we bilie, ke ya ákwà, ha we bupu ya lìe ya. 7 Ma ihe ra ka oge hour atọ gasiri, mb͕e nwunye-ya batara nime, nāmataghi ihe emereri. 8 Pita we za ya, si, Gwam, ọ̀ bu ihe ra otú a ka unu rere iberibe ala unu? Ọ si, E, ihe ra otú a. 9 Ma Pita siri ya, Gini mere unu nwere otù olu inwa Mọ nke Onye-nwe-ayi? le, ukwu nke ndi lìri di-gi di n'ọnu-uzọ, ha gēbupu kwa gi. 10 O we da n'ala ngwa ngwa n'ukwu-ya, kubìe ume: umu-okorọbia ahu we bata, hu ya ka ọ nwuru, ha we bupu ya, lìe ya n'akuku di-ya. 11 Nzukọ Kraist dum we tua oké egwu, ha na ndi nile ndi nuru ihe ndia. 12 Ma emere ọtutu ihe-iriba-ama na ọlu-ebube n'etiti ndi-Ju site n'aka ndi-ozi; ha nile were kwa otù obi nọ n'ìbà Solomon. 13 Ma nime ndi fọduru ọ dighi onye ọ bula nwere anya-ike iwere onwe-ya rapara ha n'aru: otú ọ di, ndi-Ju nēme ka ha di uku; 14 ewe tukwasi kari nye Onwe-nye-ayi ndi kwere na Ya, ìgwè madu ma ndkom ma ndinyom; 15 nke mere ka ha nēkupu ọbuná ndi aru nādighi ike, nēdebe ha n'amá, tọb͕ọ ha n'ihe-ndina na ute, ka, mb͕e Pita nāga, ka ọbuná nání onyinyo-ya we kpuchie otù onye nime ha. 16 Ọra madu nke obodo nile di Jerusalem buruburu we nāb͕akọ kwa, nēkuta ndi aru nādighi ike, na ndi ndi-mọ nādighi ọcha nēsob͕u: ewe me ka aru-ha nile n'otù n'otù di ike. 17 Ma onye-isi-nchu-àjà biliri, ya na ndi nile soro ya (nke bu irọ-òtù ndi-Sadusi), ha juputa-kwa-ra n'ekworo, 18 ha we tukwasi aka-ha n'aru ndi-ozi, tubà ha n'ulo-nkpọrọ ọra madu. 19 Ma mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi meghere ọnu-uzọ nile nke ulo-nkpọrọ ahu n'abali, we duputa ha, si, 20 Ganu, guzo, gwa kwa ndi-Ju n'ulo uku Chineke okwu nile nke Ndu a. 21 Ma mb͕e ha nuru nka, ha ba n'ulo uku Chineke mb͕e chi nābọ, we nēzí ihe. Ma onye-isi-nchu-àjà biara, ya na ndi soro ya, we kpọkọ nnọkọ-ikpé-ha, na nzukọ ndi-okenye umu Israel nile, we ziga n'ulo-nkpọrọ, ka ekuta ha. 22 Ma ndi nēje ozi ndi biara ahughi ha n'ulo-nkpọrọ; ha we laghachi, kọrọ ha, 23 si, Ayi huru ulo-nkpọrọ ka emechisiri ya ike nke-ọma, ayi hu-kwa-ra ndi-nche ka ha nēguzo n'ọnu-uzọ: ma mb͕e ayi meghere, ọ dighi onye ọ bula ayi huru nime ya. 24 Ma mb͕e ọchi-agha nke ulo Chineke na ndi-isi-nchu-àjà nuru okwu ndia, ha nwere obi abua nke-uku bayere ha ebe nka gērusi. 25 Ma otù onye biara kọrọ ha, si, Le, ndikom ahu unu tubàra n'ulo-nkpọrọ nọ n'ulo uku Chineke nēguzo nēzí kwa ndi-Ju ihe. 26 Mb͕e ahu ọchi-agha ahu na ndi nēje ozi jere, kuta ha, ma ha ejighi ihe-ike; n'ihi na ha nātu egwu ndi-Ju, ka aghara itu ha nkume. 27 Ma mb͕e ha kutasiri ha, ha guzoro ha n'etiti nnọkọ-ikpé. 28 si, Ayi nyesiri unu iwu ike ka unu ghara izí ihe n'aha nka: ma le, unu ewerewo ozizí-unu meju Jerusalem, unu nēzube kwa iweta ọbara Nwoke a tukwasi ayi n'isi. 29 Ma Pita na ndi-ozi zara, si, Ayi aghaghi ikweyere Chineke kari madu. 30 Chineke nke nna-ayi-hà mere ka Jisus si n'ọnwu bilie, Onye unu onwe-unu b͕uru, nākwuba Ya n'elu osisi. 31 Onye ahu ka Chineke were aka-nri-Ya welie elu ibu Onye-ndú na Onye-nzọputa, inye Israel nchèghari na nb͕aghara nmehie. 32 Ayi onwe-ayi bu kwa ndi-àmà nke ihe ndia; Mọ Nsọ bu kwa onye-àmà, Onye Chineke nyere ndi nēkweyere Ya. 33 Ma mb͕e ha nuru nka, amapue ha n'obi-ha, ha we zube ib͕u ha. 34 Ma otù onye biliri na nnọkọ-ikpé ahu, bú onye-Farisi, aha-ya bu Gameliel, onye nēzí iwu Moses, onye ndi-Ju nile nāsọpuru, o we kwue ka akpọpu madu ahu n'èzí nwa oge. 35 O we si ha, Ndikom nke Israel, nēzenu onwe-unu n'ihe banyere madu ndi a, ihe unu gaje ime. 36 N'ihi na mb͕e ubọchi nda akērughi Teudas biliri, nākpọ onwe-ya ihe; onye ọnu-ọgugu ndikom, ra ka nnù madu, dayere ya: onye eb͕uru; ndi nile, ka ha ra, bú ndi kweyere ya, we b͕asa, ha we ghọ ihe-efu. 37 Mb͕e onye ahu gasiri Judas onye Galili biliri n'ubọchi odide-aha, me kwa ka ufọdu n'etiti ndi-Ju so ya n'azu: onye ahu la-kwa-ra n'iyì; ewe chusa ndi nile, ka ha ra, bú ndi kweyere ya. 38 M'si kwa unu ub͕u a, Wepunu aka n'aru madu ndia, rapu-kwa-nu ha: n'ihi na ọ buru na ìzù a ma-ọbu ọlu a sitere n'aka madu agākwatu ya n'ala: 39 ma ọ buru na o sitere n'aka Chineke, unu agaghi-apu ikwatu ha n'ala; ka aghara ihu unu dika ndi nālu kwa ọ̀gù megide Chineke ma eleghi anya. 40 Ha we kweyere ya: mb͕e ha kpọsiri ndi-ozi biakute ha, ha pia ha ihe, nye ha iwu ka ha ghara ikwu okwu n'aha Jisus, ha we rapu ha ka ha la. 41 Ya mere ha siri n'iru nnọkọ-ikpé ahu la, nāṅuri na aguru ha na ndi kwesiri ka eme ha ihe-ihere n'ihi Aha ahu. 42 Ma kwa-ubọchi, n'ulo uku Chineke na n'ulo nke aka ha, ha adighi-arapu izí ihe na izisa ozi ọma Jisus, na Ọ bu Kraist.

Ọlu Ndi-Ozi 6

1 Ma na mb͕e ahu, mb͕e ndi nēso uzọ Jisus nāba uba, ndi-Ju nāsu asusu Grik malitere itamu megide ndi-Hibru, n'ihi na elefuru ndinyom-ha ndi di-ha nwuru anya n'ije-ozi, bú ikère ndi Kraist òkè, kwa-ubọchi. 2 Ndi-ozi iri na abua ahu we kpọ ọra ndi nēso uzọ Jisus biakute ha, si, Ọ dighi utọ ka ayi rapu okwu Chineke, jere table ozi. 3 Kama, umu-nna-ayi, chọputanu n'etiti unu ndikom asa ndi ab͕ara ha ezi àmà, ndi juputara na Mọ Nsọ na amam-ihe, ndi ayi gēme ndi-isi n'ọlu a di nkpà. 4 Ma ayi onwe-ayi gānọgidesi ike n'ekpere-ayi, na n'ije ozi okwu Chineke. 5 Okwu ahu we tọ ọra ha nile utọ: ha we rọputa Stifen, bú nwoke nke juputara n'okwukwe na Mọ Nsọ, ya na Filip, na Prọkọrọs, na Naikanoa, na Taimon, na Pamenas, na Nikọlas, bú onye Antiọk nke nēso uzọ ndi-Ju: 6 ndi ha guzoro n'iru ndi-ozi: mb͕e ha kpesiri ekpere, ha we bikwasi ha aka n'isi. 7 Okwu Chineke we nāga n'iru; ọnu-ọgugu nke ndi nēso uzọ Jisus nāba kwa uba na Jerusalem ri nne; oké ìgwè ndi-nchu-àjà nāṅa kwa okwukwe ahu nti. 8 Ma Stifen, ebe o juputara n'amara na ike, ọ nālu oké ọlu-ebube na ihe-iriba-ama di iche iche n'etiti ndi-Ju. 9 Ma ufọdu biliri n'etiti ndi sitere n'ulo-nzukọ nke anākpọ ulo-nzukọ nke ndi-Libatin, na nke ndi Sairini, na nke ndi Aleksandria, na nke ndi sitere na Silisia na Esia, ha na Stifen nājurita onwe-ha ajuju. 10 Ha enweghi kwa ike iguzogide amam-ihe na Mọ Nsọ o ji ekwu okwu. 11 Mb͕e ahu ha jiri aghughọ we rọputa ndikom, ndi siri, Ayi anuwo ya ka o nēkwu okwu nēkwulu Moses na Chineke. 12 Ha we kpalie ndi-Ju, na ndi-okenye, na ndi-ode-akwukwọ, we biakwasi ya, jide ya, kubata ya na nnọkọ-ikpé, 13 we guzo ndi-àmà ugha, ndi si, Nwoke a arapughi ikwu okwu megide ebe nsọ a, na iwu-ayi: 14 n'ihi na ayi anuwo ya ka ọ nāsi, na Jisus nka, bú Onye Nazaret, gākwatu ebe a, nwo kwa ọme-n'ala nile nke Moses rara nye ayi n'aka. 15 Ndi nile ndi nọduru na nnọkọ-ikpé ahu, mb͕e ha legidere ya anya, ha we hu iru-ya dika ọ bu iru mọ-ozi.

Ọlu Ndi-Ozi 7

1 Onye-isi-nchu-àjà we si, Ìhe ndia di otú a? 2 O we si, Umu-nnam na ndi bu nnam, nurunu. Chineke nke ebube mere ka nna-ayi Abraham hu Ya anya, mb͕e ọ nọ na Mesọpọtemia, mb͕e ọ kēbighi na Heran, 3 O we si ya, Si n'ala-gi na n'etiti ikwu-gi pua, bia n'ala ahu nke M'gēgosi gi. 4 Mb͕e ahu o siri n'ala ndi Kaldea puta, we biri na Heran: mb͕e nna-ya nwuru, Chineke we me ka o site n'ebe ahu bia biri n'ala nka, nke unu onwe-unu bi nime ya ub͕u a: 5 ma O nyeghi ya ala-nketa nime ya, é-è, Ọ nyeghi ya ebe izọkwasi ukwu-ya: O we kwe nkwa na O gēwere ya nye ya, na nkpuru-ya soro ya n'azu, ka ọ buru ihe ha nwere, mb͕e ọ kādighi nwa ọ muru. 6 Ma Chineke kwuru okwu otú a, na nkpuru-ya gānọ dika ndi-ọbìa n'ala nābughi nke aka ha, na ndi ala ahu gēme kwa ha ka ha buru ndi-orù, me kwa ha ihe ọjọ, nnù arọ. 7 Mba ahu nke ha gābu orù-ha ka Mu onwem gēkpe kwa ikpé, ka Chineke kwuru: mb͕e ihe ndia gasiri ha gāputa kwa, kpe-kwa-ram n'ebe a. 8 O we nye ya ọb͕ub͕a-ndu nke obibì-úgwù: otú a Abraham we mua Aisak, we bì ya úgwù n'ubọchi nke-asatọ; Aisak we mua Jekob, Jekob we mua nna uku ayi iri na abua. 9 Nna uku ahu, ebe ha nēkwo Josef ekworo, ha we re ya ga n'Ijipt: ma Chineke nọyere ya, 10 weputa kwa ya na nkpab͕u-ya nile, nye kwa ya amara na amam-ihe n'iru Fero eze Ijipt; o we me ya onye-isi Ijipt na ulo-ya dum. 11 Oké unwu we dikwasi Ijipt na Kenean dum, ya na oké nkpab͕u: nna-ayi-hà ahughi ihe gēju ha afọ. 12 Ma mb͕e Jekob nuru na ọka di n'Ijipt, o we zipu nna-ayi-hà na mbu. 13 Na nke mere ya ub͕ò abua ewe me ka umu-nne Josef mara Josef; ewe me ka ndi-aru Josef puta ìhè nye Fero. 14 Josef we ziga, kpọ Jekob, bú nna-ya, na ikwu-ya nile, ka ha biakute ya, ọgu madu atọ na iri na ise. 15 Jekob we ridata n'Ijipt; o we nwua, ya onwe-ya, na nna-ayi-hà; 16 ewe būru ha gabiga n'ofè rue Shekem, tọb͕ọ ha n'ílì ahu nke Abraham were ọnu-ahia n'ọla-ọcha go n'aka umu Hemoa nime Shekem. 17 Ma mb͕e oge nkwa ahu nēru nso, nke Chineke kwere Abraham, ndi-Ju gara n'iru ba kwa uba n'Ijipt, 18 rue mb͕e eze di iche biliri ibu eze Ijipt, onye nāmataghi Josef. 19 Onye ahu were aghughọ meso ndi-aru-ayi, me kwa nna-ayi-hà ihe ọjọ, ka ha we tufue umu ọhu ha ka aghara ime ka ha di ndu. 20 N'oge ahu ka amuru Moses, o we ma nma nke-uku; ewe zùa ya ọnwa atọ n'ulo-ya: 21 ma mb͕e etufuru ya, nwa-nwanyi Fero paliri ya, zùa ya ka ọ buru nwa ya onwe-ya nwere. 22 Ewe zí Moses ihe n'amam-ihe nile nke ndi Ijipt; o we di ike n'okwu-ya na ọlu-ya nile. 23 Ma mb͕e o rubere ọgu arọ abua, ileta umu-nne-ya, bú umu Israel, batara n'obi-ya. 24 Ma mb͕e ọ huru otù onye nime ha ka anēmejọ, ọ lubara ya ọ̀gù, we kpeputa onye anēmub͕u, ebe o tib͕uru onye Ijipt: 25 ma o chère na umu-nne-ya ghọtara na Chineke nēsi n'aka-ya enye ha nzọputa; ma ha aghọtaghi. 26 N'ubọchi soni o we me ka ha hu ya anya mb͕e ha nālu ọ̀gù, o we mebe ka ha dirita n'udo, si, Ndikom, unu bu umu-nne; gini mere unu nēmejọrita onwe-unu? 27 Ma onye nēmejọ ibe-ya nupuru ya, si, Ònye mere gi ka i buru onye-isi na onye-ikpé n'ebe ayi nọ? 28 Ọ̀ bu ib͕um ka gi onwe-gi nāchọ, dika i b͕uru onye Ijipt nyahuru? 29 Moses we b͕alaga n'okwu a, we nọ dika ọbìa n'ala Midian, ebe ọ muru umu-ndikom abua. 30 Mb͕e ọgu arọ abua zuru, ewe me ka ọ hu mọ-ozi n'ọhia nke ugwu Sainai, n'ire ọku nime osisi ntà. 31 Ma mb͕e Moses huru ya, ihe ọ huru juru ya anya: ma mb͕e ọ nābiaru nso ikiri ya, olu nke Onye-nwe-ayi dara, 32 si, Mu onwem bu Chineke nke nna-gi-hà, Chineke nke Abraham, na nke Aisak, na nke Jekob. Aru we ma Moses jijiji, o nweghi kwa anya-ike ikiri. 33 Onye-nwe-ayi we si ya, Tọpu akpukpọ-ukwu n'ukwu-gi abua: n'ihi na ebe i nēguzo bu ala nsọ. 34 N'ezie ahuwom ihe ọjọ anēme ndim nke di n'Ijipt, anuwokwam isu-udè-ha, M'we ridata iweputa ha: ub͕u a bia kwa, M'gēziga gi n'Ijipt. 35 Moses nka, onye ha juru aju, si, Onye mere gi ka i buru onye-isi na ikpé? onye a ka Chineke ziteworo ibu onye-isi, ibu kwa onye-nb͕aputa, ya na aka mọ-ozi ahu nke emere ka ọ hu ya n'osisi ntà ahu. 36 Nwoke a duputara ha, mb͕e ọ lusiri ọlu-ebube di iche iche na ihe-iriba-ama di iche iche n'Ijipt, na nime Oké Osimiri Uhie, na nime ọhia ọgu arọ abua. 37 Onye a bu Moses ahu, onye siri umu Israel, Chineke gēme ka Onye-amuma, Nke di ka mu onwem, biliere unu site n'etiti umu-nne-unu. 38 Nwoke a bu onye nānọri nime nzukọ n'ọhia, ya na mọ-ozi ahu nke gwara ya okwu n'ugwu Sainai, na nna-ayi-hà: onye nara okwu di ndu nke si n'ọnu Chineke puta inye ayi: 39 onye nna-ayi-hà nāchọghi iṅa nti, kama ha nupuru ya n'ebe ha nọ, we laghachi azu n'Ijipt n'obi-ha, 40 nāsi Eron, Mere ayi chi ndi ganēje n'iru ayi: n'ihi na Moses a, onye duputara ayi n'ala Ijipt, ayi amataghi ihe mere ya. 41 Ha we kpua nwa-ehi n'ubọchi ahu, we butere arusi ahu ihe àjà, we ṅuria n'ọlu aka-ha. 42 Ma Chineke chighariri, we rara ha nye ikpere usu ihe di n'elu-igwe; dika edeworo ya n'akwukwọ ndi-amuma, si, Ọ̀ di anu eb͕uru eb͕u na àjà unu wetaramỌ̀gu arọ abua n'ọhia, unu ulo Israel? 43 Unu we palie ulo-ikwū nke Mọlọk, Na kpakpando nke chi ahu, bú Refan, Ihe-atù unu mere ikpọ isi ala nye ha: M'gēme kwa ka unu je biri n'ofè Babilon. 44 Nna-ayi-hà nwere ulo-ikwū nke àmà n'ọhia, dika Ọ kara àkà, bú Onye gwara Moses, ka o me ya ka ọ di ka ihe-atù nke ọ hururi. 45 Nke, mb͕e o ruru ha aka, nna-ayi-hà na Joshua bubatara, mb͕e ha natara ala nke mba nile ahu, ndi Chineke nupuru n'iru nna-ayi-hà, rue ubọchi Devid; 46 onye huru amara n'iru Chineke, we riọ ichọtara Chineke nke Jekob ebe-obibi. 47 Ma Solomon wuru Ya ulo. 48 Otú ọ di, Onye kachasi ihe nile elu adighi-ebi n'ulo eji aka wu; dika onye-amuma siri, 49 Elu-igwe bu oche-ezem, Uwa bu kwa ihe-nb͕akwasi-ukwu nke ukwum abua: Àha ulo gini ka unu gēwurum? ka Onye-nwe-ayi kwuru: Ma-ọbu gini bu ebe izu-ikem? 50 Ọ̀ bughi akam mere ihe ndia nile? 51 Ndi kwesiri olu ike na ndi anēbighi úgwù n'obi na nti, unu onwe-unu nālu ọ̀gù megide Mọ Nsọ mb͕e nile: dika nna-unu-hà mere, otú ahu ka unu onwe-unu nēme. 52 Onye nime ndi-amuma ka nna-unu-hà nēsob͕ughi? ha we b͕ue ndi buru uzọ kwusa okwu bayere ọbibia nke Onye ezi omume ahu; Onye unu onwe-unu ghọrọ ub͕u a ndi rara Ya nye na ndi b͕uru Ya: 53 unu ndi natara iwu ahu dika enyere ya site n'aka ndi-mọ-ozi, ma unu edebeghi ya. 54 Ma mb͕e ha nuru ihe ndia, ewe mapue ha n'obi-ha, ha we takwasi ya ikekere ezé-ha. 55 Ma, ebe o juputara na Mọ Nsọ, ọ legide anya n'elu-igwe, we hu ebube Chineke, na Jisus ka Ọ nēguzo n'aka-nri Chineke, 56 o we si, Le, anamahu elu-igwe ka emegheworo ha, na Nwa nke madu ka Ọ nēguzo n'aka-nri Chineke. 57 Ma ha were oké olu ti nkpu, kpuchi kwa aka na nti-ha, were otù obi nukwasi ya; 58 ha we tupu ya n'obodo, tu kwa ya nkume: ndi-àmà we wusa uwe-ha n'ukwu otù nwa-okorọbia anākpọ Sọl. 59 Ha we tua Stifen nkume, ka ọ nākpọku Onye-nwe-ayi, nāsi, Onye-nwe-ayi Jisus, nara mọm nke-ọma. 60 O we b͕u ikperè n'ala, were kwa oké olu ti nkpu, si, Onye-nwe-ayi, atukwasila nmehie a n'isi-ha. Mb͕e o kwusiri okwu a, o we da n'ura.

Ọlu Ndi-Ozi 8

1 Ma ob͕ub͕u-ya di Sọl ezi nma. Oké nsob͕u we puta n'ubọchi ahu megide nzukọ Kraist di na Jerusalem; ha nile we b͕asasia n'ala Judia na Sameria dum, ma-ọbughi ndi-ozi. 2 Ndikom ufọdu ndi nātu egwu Chineke we lìe Stifen, kwa-kwa-ra ya oké ákwá. 3 Ma Sọl nēsob͕u nzukọ Kraist nke-uku, nābà n'ulo nile n'otù n'otù, ọ nādọkpu kwa ndikom na ndinyom we rara ha nye ka atubà ha n'ulo-nkpọrọ. 4 Ya mere ndi b͕asara jeghariri nēzisa ozi ọma, bú okwu Chineke. 5 Filip we rida n'obodo Sameria, kwusara ha Kraist-ayi. 6 Ìgwè madu nile we were otù obi nāṅa nti ihe nile Filip nēkwu, mb͕e ha nuru, hu kwa ihe-iriba-ama ọ nēme. 7 N'ihi na site n'aru ọtutu ndi nwere ndi-mọ nādighi ọcha ka mọ ahu putara, nēwere oké olu ti nkpu: eme-kwa-ra ka aru ọtutu madu di ike, bú ndi akuku-aru-ha nwuru anwu, na ndi dara ngwurọ. 8 Oké ọṅù we di n'obodo ahu. 9 Ma otù nwoke di, Saimon bu aha-ya, onye n'oge gara aga nēme mb͕asi n'obodo ahu, nēme kwa ka ibobo nwua mba Sameria n'aru, nāsi na ya onwe-ya bu onye uku: 10 onye ha nile, site n'onye ntà rue onye uku nāṅa nti, si, Onye a bu ike ahu nke Chineke nke anākpọ Ike Uku. 11 Ha we nāṅa ya nti, n'ihi na o wereri mb͕asi-ya nile me ka ibobo nwua ha n'aru n'oge di anya. 12 Ma mb͕e ha kwere Filip ka o nēzisa ozi ọma bayere ala-eze Chineke na aha Jisus Kraist, ewe me ha baptism, ma ndikom ma ndinyom. 13 Saimon onwe-ya we kwere kwa: mb͕e emesiri ya baptism, o we nọgidesi ike n'ebe Filip nọ; mb͕e ọ nāhu na anēme ihe-iriba-ama na oké ọlu di ike di iche iche, ibobo we nwua ya n'aru. 14 Ma mb͕e ndi-ozi ndi nọ na Jerusalem nuru na Sameria anarawori okwu Chineke nke-ọma, ha zigara ha Pita na Jọn: 15 ndi, mb͕e ha ridatara, ha kpere ekpere bayere ha, ka ha we nara Mọ Nsọ: 16 n'ihi na ọ kādakwasighi n'isi onye ọ bula n'etiti ha: ọ bu nání na emere ha-ri baptism ibà n'aha Onye-nwe-ayi Jisus. 17 Mb͕e ahu ha bikwasiri ha aka-ha n'isi, ha we nara Mọ Nsọ. 18 Ma mb͕e Saimon huru na anēnye Mọ Nsọ site n'ibikwasi aka nke ndi-ozi, o chere ego n'iru ha, 19 si, Nye-kwa-num ike a, ka, onye ọ bula m'gēbikwasi akam abua n'isi, ka o we nara Mọ Nsọ. 20 Ma Pita siri ya, Ka ọla-ọcha-gi so gi la n'iyì, n'ihi na i chère na i gānata onyinye Chineke site n'ego. 21 I nweghi òkè ma-ọbu ihe-nketa n'okwu a: n'ihi na obi-gi ezighi ezi n'iru Chineke. 22 Ya mere chègharia n'obi ọjọ gi a, riọ Onye-nwe-ayi, ma eleghi anya agāb͕aghara gi èchìchè obi-gi. 23 N'ihi na ahurum na i nọ n'òlùlù ilu na ab͕u nke ajọ omume. 24 Saimon we za, si, Unu onwe-unu riọrọm Onye-nwe-ayi, ka ihe ọ bula nime ihe unu kwuworo ghara ibiakwasim. 25 Ya mere, mb͕e ha dusiri ọdu kwu kwa okwu Onye-nwe-ayi, ha laghachiri na Jerusalem, nēzisa kwa ozi ọma nye ọtutu obodo ntà ndi Sameria. 26 Ma mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi gwara Filip okwu, si, Bilie, nāga n'akuku Ndida rue uzọ nke si na Jerusalem arida rue na Geza: uzọ ahu bu ọhia. 27 O we bilie ga: ma le, otù nwoke nke Etiopia, bú onozi nke di ike nke-uku n'okpuru Kandesi, eze-nwanyi ndi Etiopia, onye emere onye-isi àkù-ya nile, onye biarari na Jerusalem ikpọ isi ala nye Chineke; 28 o we nālaghachi, nānọdu kwa n'ub͕ọ-ya, nāgu kwa akwukwọ Aisaia onye-amuma. 29 Mọ Nsọ we si Filip, Jekuru ub͕ọ-ala ahu, nọnyaba kwa ya nso. 30 Filip we b͕akuru ya, we nu ya ka ọ nāgu akwukwọ Aisaia onye-amuma, o we si, Ì nāmata ihe i nāgu? 31 Ọ si, É-è, n'ihi na #m'gēsi aṅa pu imata, ma ọ buru na ọ dighi onye gēdum? O we riọ Filip ka ọ rigota, ka ya na ya nọdu. 32 Ma ibe ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nke ọ nāgu bu nka, Esekpuru Ya, dika aturu, je ob͕ub͕u; Dika nwa-aturu da-kwa-ra ob͕i n'iru onye nākpacha ya aji, Otú a ka Ọ nādighi-asaghe ọnu-Ya: 33 Ewepuru ikpé-Ya nime ọnọdu-Ya di ala: Ònye gākọ ọb͕ọ Ya? N'ihi na anēwepu ndu-Ya n'uwa. 34 Onozi ahu we za Filip, si, Ariọm i, ònye ka onye-amuma nka nēkwu okwu a bayere? ọ̀ bu ya onwe-ya ma-ọbu onye ọzọ di iche? 35 Filip we saghe ọnu-ya, zì ya ozi ọma Jisus, nāmalite site n'ihe a edeworo n'akwukwọ nsọ. 36 Ma mb͕e ha nāga n'uzọ, ha biaruru otù miri; onozi ahu we si, Le, miri; gini nānapu imem baptism? 37 Filip we si ya, Ọ buru na i ji obi-gi dum we kwere, agēme gi. O we za, si, Ekwerem na Jisus Kraist bu Ọkpara Chineke. 38 O we kwue ka ub͕ọ-ala-ya guzo: ha abua we rida na miri, ma Filip ma onozi ahu; o we me ya baptism. 39 Ma mb͕e ha siri na miri rigota, Mọ nke Onye-nwe-ayi wepuru Filip; onozi ahu ahughi kwa ya ọzọ, n'ihi na ọ nāga n'uzọ-ya nāṅuri ọṅu. 40 Ma ahuru Filip n'Azotọs: mb͕e ọ nāgabiga ọ nēzisa kwa ozi ọma gwa ndi obodo ahu nile, rue mb͕e ọ biaruru Sisaria.

Ọlu Ndi-Ozi 9

1 Ma Sọl, ebe ọ nēwere iba-nba na ob͕ub͕u ku ume megide ndi nēso uzọ Onye-nwe-ayi rue ub͕u a, o jekuru onye-isi-nchu-àjà, 2 riọ akwukwọ-ozi n'aka-ya igaru Damaskọs inye ndi ulo-nzukọ, ka ọ gābu, ma asi na ọ chọtara ndi ọ bula di n'Uzọ a, ma-ọbu ndikom ma-ọbu ndinyom, ka o we dọkpuru ha n'ab͕u bia Jerusalem. 3 Ma mb͕e ọ nāga, o rue na ọ nābiaru Damaskọs nso: na mberede ìhè si n'elu-igwe b͕uru ya àmùmà buruburu: 4 o we da n'ala, nu otù olu ka ọ nāsi ya, Sọl, Sọl, gini mere i nēsob͕um? 5 O we si, Ì bu Onye, Onye-nwe-ayi? Ọ si Mu onwem bu Jisus, Onye gi onwe-gi nēsob͕u: 6 ma bilie, ba nime obodo, agāgwa gi ihe i nāghaghi ime. 7 Ndikom ndi soro ya n'ije we guzo apughi ikwu okwu, ebe ha nānu olu ahu, ma ha ahughi onye ọ bula. 8 Sọl we si n'ala bilie; ma mb͕e anya-ya saghere, ọ hughi ihe ọ bula; ha we jide ya n'aka duru ya, we dubata ya na Damaskọs. 9 Ọ hughi kwa uzọ ubọchi atọ, ọ dighi kwa ihe ọ nēri ma-ọbu nke ọ nāṅu. 10 Ma otù onye nke nēso uzọ Jisus nọ na Damaskọs, aha-ya bu Ananaias; Onye-nwe-ayi we si ya n'ọhù, Ananaias. O we si, Le, mu onwem, Onye-nwe-ayi. 11 Onye-nwe-ayi we si ya, Bilie, ga rue amá nke anākpọ Amá Eguzoziri, chọ kwa n'ulo Judas otù onye aha-ya bu Sọl, onye Tasọs: n'ihi na le, ọ nēkpe ekpere; 12 ọ hu-kwa-ra otù nwoke, aha-ya bu Ananaias, ka ọ nābata, nēbikwasi kwa ya aka-ya abua n'isi, ka ewe me ka ọ hu uzọ. 13 Ma Ananaias zara, si, Onye-nwe-ayi, anurum n'ọnu ọtutu madu ihe bayere nwoke a, ka ha ra, bú ajọ ihe o mere ndi nsọ Gi na Jerusalem: 14 n'ebe a ka o nwe-kwa-ra ike site n'ebe ndi-isi-nchu-àjà nọ ike ndi nile nākpọku aha-Gi ab͕u. 15 Ma Onye-nwe-ayi siri ya, Ga: n'ihi na onye ahu bu ihe-ọlu arọputara nyem, ka o buru aham che n'iru mba ọzọ na ndi-eze, na umu Israel: 16 n'ihi na Mu onwem gēgosi ya ka ha ra, bú ahuhu nile ọ nāghaghi ihu n'ihi aham. 17 Ananaias we je, ba n'ulo ahu; o we bikwasi ya aka-ya abua n'isi, si, Sọl, nwa-nnam, Onye-nwe-ayi, bú Jisus, Onye mere ka i hu Ya n'uzọ i si bia, ezitewom, ka ewe me ka i hu uzọ, ka i we juputa kwa na Mọ Nsọ. 18 Ngwa ngwa ihe dika akpirikpa we si n'anya-ya dapu, eme-kwa-ra ka ọ hu uzọ; o we bilie, eme ya baptism; 19 o we nara nri, ewe me ka ọ nwe ume. Ya na ndi nēso uzọ Jisus na Damaskọs we nọ ubọchi ufọdu. 20 Ngwa ngwa n'ulo-nzukọ-ha nile o we nēkwusa Jisus, na Ya onwe-ya bu Ọkpara Chineke. 21 Ibobo we nwua ndi nile nuru ya n'aru, ha nāsi, Ọ̀ bughi onye a bu onye mebiri nime Jerusalem ndi nākpọku aha nka? ọ bia-kwa-rari n'ebe a ime ihe a, bú, ka o we dọkpuru ha n'ab͕u je n'iru ndi-isi-nchu-àjà. 22 Ma emere Sọl ka o nwe kari ike, ọ nēkwu kwa okwu nke b͕ara ndi-Ju bi na Damaskọs ghari, ebe ọ nēgosi nke-ọma na Onye a bu Kraist-ha. 23 Ma mb͕e ọtutu ubọchi zuru, ndi-Ju b͕ara ìzù ib͕u ya: 24 ma emere ka Sọl mara ajọ ìzù-ha. Ha we nēche kwa ọnu-uzọ-ama nile ehihie na abali ka ha we b͕ue ya: 25 ma ndi nēso uzọ-ya kuru ya n'abali, weda ya n'ala site na mb͕idi nke obodo, nārada ya n'abọ. 26 Ma mb͕e ọ biaruru Jerusalem, ọ nwara iwere onwe-ya rapara n'aru ndi nēso uzọ Jisus: ma ha nile nātu egwu ya, ebe ha nēkweghi na ọ bu onye nēso uzọ Jisus. 27 Ma Banabas jidere ya n'aka, we duru ya jekuru ndi-ozi, kọrọ ha otú ọ hururi Onye-nwe-ayi n'uzọ, kọkwa-ra ha, si, na Ọ gwara ya-ri okwu, ya na otú o kwuwarari okwu na Damaskọs n'aha Jisus. 28 Ya na ha we nọ, ọ nābata nāpu kwa na Jerusalem, 29 nēkwuwa okwu n'aha Onye-nwe-ayi: o we nāgwa ndi-Ju nāsu asusu Grik okwu, ya na ha nājurita kwa onwe-ha ajuju; ma ha tiyere aka-ha ib͕u ya. 30 Ma mb͕e umu-nna nime Kraist mazuru ya, ha dudara ya rue Sisaria, we zipu ya igaru Tasọs. 31 Ya mere nzukọ Kraist nime Judia na Galili na Sameria dum nwere udo, ebe anēwuli ya elu dika ulo; ọ nāba kwa uba, ebe ọ nāga n'egwu Onye-nwe-ayi na nkasi-obi nke Mọ Nsọ. 32 O rue, mb͕e Pita nējezu n'ebe nile, ọ ridakuru kwa ndi nsọ ndi bi na Lida. 33 O we hu n'ebe ahu otù nwoke, aha-ya bu Ineas, onye tọb͕ọrọ arọ asatọ n'ute-ya; n'ihi na akuku-aru-ya nwuru anwu. 34 Pita we si ya, Ineas, Jisus Kraist nēme gi ka aru di gi ike: bilie, dozi kwa ute nke gi. Ngwa ngwa o we bilie. 35 Ndi nile bi na Lida na Sheron we hu ya, ndi ahu we chigharikute Onye-nwe-ayi. 36 Ma otù nwanyi nke nēso uzọ Jisus nọ na Jọpa, aha-ya bu Tabita, nke anākpọ Dọkas, ma asugharia ya: nwanyi a juputara n'ezi ọlu na ọlu ebere nke ọ nēme. 37 Ma o ruru n'ubọchi ahu, na aru-ya adighi ike, o we nwua: mb͕e ha sasiri ya aru, ha tọbọ ya n'ime-ulo di n'elu ulo. 38 Ma ebe Lida di Jọpa nso, ndi nēso uzọ Jisus, ebe ha nuru na Pita nọ n'ebe ahu, ha zigara ya ndikom abua, nāriọ ya, si, Alala azu ibiakute ayi. 39 Pita we bilie so ha je. Ma mb͕e ọ biaruru, ha duru ya rigo n'ime-ulo ahu di n'elu ulo: ndinyom nile ndi di-ha nwuru guzo-kwa-ra ya nso nākwa ákwá, nēgosi kwa uwe-ime na uwe ọzọ, ka ha ra, bú nke Dọkas nēme mb͕e ya na ha nọ. 40 Ma Pita chupuru ha nile n'èzí, we b͕ue ikperè n'ala, kpe ekpere; o we chigharia n'ebe ozu ahu di, si, Tabita, bilie. Nwanyi ahu we saghe anya-ya; mb͕e ọ huru Pita, o we nọlie. 41 O we nye ya aka-ya, palie ya elu; mb͕e ọ kpọsiri ndi nsọ na ndinyom ndi di-ha nwuru, ọ che ya na ndu n'iru ha. 42 Ewe mara ya na Jọpa dum: ọtutu madu we kwere n'Onye-nwe-ayi. 43 O we rue, na ọ nọgidere ọtutu ubọchi na Jọpa n'ulo otù onye, bú Saimon, onye nēdozi akpukpọ anu.

Ọlu Ndi-Ozi 10

1 Ma otù nwoke nọ na Sisaria, aha-ya bu Kọniliọs, ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise nke òtù ndi-agha ahu anākpọ òtù Itali, 2 onye nāsọpuru Chineke, onye ya na èzí-na-ulo-ya nile nātu kwa egwu Chineke, onye nālu ọtutu ọlu ebere nye ndi-Ju, nēkpe-kwa-ra Chineke ekpere mb͕e nile. 3 Ọ huwara n'ọhù, n'ihe ra ka oge hour nke-iteghete n'ehihie, mọ-ozi nke Chineke, ka ọ nābiakute ya, nāsi kwa ya, Kọniliọs. 4 O we legide ya anya, tu kwa egwu, si, Ọ̀ bu gini, Onye-nwe-ayi? Ọ si ya, Ekpere-gi nile na ọlu ebere gi nile rigoro ibu ihe-ncheta n'iru Chineke. 5 Ub͕u a ziga kwa ndikom na Jọpa, kpọta otù onye, bú Saimon, onye anākpọ kwa Pita: 6 onye ahu nānọ dika ọbìa n'ulo otù onye, bú Saimon, onye nēdozi akpukpọ anu, onye ulo-ya di n'usọ oké osimiri. 7 Ma mb͕e mọ-ozi ahu nke gwara ya okwu lasiri, ọ kpọ madu abua nime ndi nējere ya ozi, na otù onye-agha nke nāsọpuru Chineke nime ndi nānọgide ya nso mb͕e nile; 8 mb͕e ọ kọsiri ha ihe nile, o we ziga ha na Jọpa. 9 Ma n'echi-ya, mb͕e ndi ahu nọ n'ije-ha, nābiaru kwa obodo ahu nso, Pita rigoro n'elu ulo ikpe ekpere, n'ihe ra ka oge hour nke-isi: 10 agu we gua ya, o we chọ idetu ihe ọnu: ma mb͕e ha nēdozi ihe, ihe di ka inyoghi biara ya n'anya; 11 o we hu elu-igwe ka emeghere ya-ri, ya na otù ihe ka ọ nārida, dika oké ákwà ọcha, anēsi na nkuku anọ eweda ya n'ala: 12 nke anu ukwu anọ na ihe nākpu akpu nke ala na anu-ufe nke elu-igwe nile di iche iche di nime ya. 13 Otù olu we bia rue ya nti, si, Pita, bilie; b͕ue, ri kwa. 14 Ma Pita siri, M'gaghi-eri ma-ọli, Onye-nwe-ayi; n'ihi na ọ dighi mb͕e ọ bula m'riri ihe ọ bula nke ruru árú nke nādighi kwa ọcha. 15 Otù olu we bia rue ya nti ọzọ nke ub͕ò abua, si, Ihe Chineke mere ka ha di ọcha, gi onwe-gi emela ha ihe ruru árú. 16 Ewe me ihe a ub͕ò atọ: ngwa ngwa ewe nara ákwà ahu rigo n'elu-igwe. 17 Ma mb͕e Pita nēnwe obi abua nime onwe-ya ihe ọ gābu, bú ọhù ọ hururi, le, ndikom ahu ndi Kọniliọs zitereri, ebe ha jusiri ajuju ulo Saimon, ha guzoro n'ọnu-uzọ-ama, 18 we kpọ jua ma Saimon, onye anākpọ kwa Pita, nānọ dika ọbìa n'ebe ahu. 19 Ma mb͕e ọhù ahu nādi n'obi Pita, Mọ Nsọ siri ya, Le, ndikom atọ nāchọ gi. 20 Ma bilie, rida, so ha ga, enweghi uche abua: n'ihi na Mu onwem ezitewo ha. 21 Pita we ridakuru ndikom ahu, si, Le, mu onwem bu onye unu nāchọ: gini bu ihe unu biaworo n'ihi ya? 22 Ha we si, Kọniliọs ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, nwoke bu onye ezi omume nke nātu kwa egwu Chineke, onye mba ndi-Ju dum nāb͕a-kwa-ra ya ezi àmà, ya ka mọ-ozi nke di nsọ duru ọdú site na Chineke, ikpọta gi n'ulo-ya, na inu okwu ufọdu si gi n'ọnu puta. 23 Ya mere ọ kpọbatara ha, le ha ọbìa. Ma n'echi-ya o bilie so ha pua, ufọdu nime umu-nna nime Kraist, bú ndi Jọpa, so-kwa-ra ya je. 24 N'echi-ya ha ba nime Sisaria. Ma Kọniliọs nēle anya ha, ọ kpọkọ-kwa-rari ndi-ikwu-ya na ndi-eyì-ya ọ huru n'anya. 25 Ma mb͕e o ruru na Pita batara, Kọniliọs zutere ya, da n'ala n'ukwu-ya, kpọ isi ala nye ya. 26 Ma Pita weliri ya elu, si, Bilie; mu onwem bu kwa madu. 27 Ka ya na ya nākparita uka, ọ ba nime, hu ọtutu madu ndi b͕akọrọri: 28 o we si ha, Unu onwe-unu mara otú ọ bu ihe nēzighi ezi n'iwu ka nwoke nke bu onye-Ju were onwe-ya rapara n'aru onye mba ọzọ ma-ọbu ijekuru ya; otú ọ di, mu onwem ka Chineke gosiri ka m'ghara ikpọ madu ọ bula ihe ruru árú ma-ọbu ihe nādighi ọcha: 29 n'ihi nka ka m'bia-kwa-ra nārugharighi uka, mb͕e eji kpọtam. Ya mere anamaju, Òkwu gini mere unu ji kpọtam? 30 Kọniliọs we si, Ubọchi anọ gara aga, rue oge hour nka, m'nēkpe ekpere n'oge hour nke-iteghete n'ulom; ma le, otù nwoke guzoro n'irum n'uwe nēnwu enwu, 31 si, Kọniliọs, anuru ekpere-gi, echeta-kwa-ra ọlu ebere gi nile n'iru Chineke. 32 Ya mere ziga na Jọpa, kpọtara onwe-gi Saimon, onye anākpọ kwa Pita; onye ahu nānọ dika ọbìa n'ulo Saimon, bú onye nēdozi akpukpọ anu n'usọ oké osimiri. 33 Ya mere n'otù oge ahu ka m'zigara gi; gi onwe-gi me-kwa-ra nke-ọma na i biawo. Ya mere ub͕u a ayi onwe-ayi nile nọ n'ebe a n'iru Chineke, inu ihe nile nke Onye-nwe-ayi nyeworo gi n'iwu. 34 Pita we saghe ọnu-ya, si, N'ezie anamaghọta na Chineke abughi onye nēle madu anya n'iru: 35 kama nime mba ọ bula onye nātu egwu Ya, onye nālu kwa ọlu ezi omume, bu onye Ọ nānara nke-ọma. 36 Okwu nke O zitere umu Israel, nēzisa ozi ọma nke udo site n'ọnu Jisus Kraist (Onye ahu bu Onye-nwe madu nile) 37 akukọ ahu unu onwe-unu matara, nke putara ìhè na Judia dum, nāmalite site na Galili, mb͕e baptism nke Jọn kwusara gasiri; 38 bú Jisus Nke si na Nazaret puta, otú Chineke were Mọ Nsọ na ike te Ya dika manu-otite: Onye jeghariri nālu ọlu ọma, nēme kwa ka aru di ha ike, bú ndi nile ekwensu mere ha dika onye-nwe-ha; n'ihi na Chineke soro Ya. 39 Ayi onwe-ayi bu kwa ndi-àmà nke ihe nile O mere n'ala ndi-Ju, na nime Jerusalem; Onye ha b͕u-kwa-ra, nākwuba Ya n'elu osisi. 40 Onye ahu ka Chineke mere ka O si n'ọnwu bilie n'ubọchi nke-atọ, O were kwa Ya nye ka egosi Ya n'ìhè. 41 Ọ bughi ndi-Ju nile ka egosiri Ya, kama ọ bu ndi-àmà Chineke buru uzọ rọputa, bú ayi onwe-ayi, ndi soro Ya nēri nāṅu kwa mb͕e O siri na ndi nwuru anwu bilie. 42 O we nye ayi iwu ka ayi kwusara ndi-Ju, ka ayi kwusi kwa ike na Onye a bu Onye Chineke kaworo ibu Onye-ikpé nke ndi di ndu na ndi nwuru anwu. 43 Onye ahu ka ndi-amuma nile nāb͕ara àmà, na site n'aha-Ya onye ọ bula nke kwere na Ya gānata nb͕aghara nmehie. 44 Mb͕e Pita kpu akukọ ndia n'ọnu, Mọ Nsọ dakwasiri ndi nile nuru okwu ahu. 45 Ibobo we nwua ha n'aru, bú ndi kwere na Jisus ndi sitere na ndi obibì-úgwù, ka ha ra, bú ndi soro Pita bia, n'ihi na awusawo-kwa-ra onyinye nke bu Mọ Nsọ n'isi ndi mba ọzọ. 46 N'ihi na ha nānu ka ha nēkwu okwu n'asusu ọzọ di iche iche, nēme kwa ka Chineke di uku. Mb͕e ahu Pita zara, si, 47 Ọ̀ di onye puru inapu miri, ka aghara ime ndia baptism, ndi natara Mọ Nsọ dika ayi onwe-ayi? 48 O we kwue ka eme ha baptism n'aha Jisus Kraist. Mb͕e ahu ha riọrọ ya ka ọ nọgide ubọchi ufọdu.

Ọlu Ndi-Ozi 11

1 Ma ndi-ozi na umu-nna nime Kraist ndi nọ na Judia dum nuru na ndi mba ọzọ nara-kwa-ri okwu Chineke nke-ọma. 2 Mb͕e Pita rigotara Jerusalem, ndi sitere na ndi obibì-úgwù we kwugide ya okwu, 3 si, I bakuru ndikom ndi anēbighi úgwù, so ha rie ihe. 4 Ma Pita malitere, we kọrọ ha okwu ahu n'usoro, si, 5 Mu onwem nọ n'obodo Jọpa nēkpere: m'we hu ọhù nime inyoghi, otù ihe ka ọ nārida, dika oké ákwà ọcha nke anēsi n'elu-igwe were nkuku anọ eweda n'ala; o we bia rue ọbuná n'ebe m'nọ: 6 mb͕e m'legidere ya anya, m'we tugharia uche, hu anu ukwu anọ di n'uwa na anu-ọhia na ihe nākpu akpu na anu-ufe nke elu-igwe nile di iche iche. 7 M'we nu kwa otù olu ka ọ nāsim, Pita, bilie; b͕ue, ri kwa. 8 Ma asirim, M'gaghi-eri ma-ọli, Onye-nwe-ayi: n'ihi na ọ dighi mb͕e ọ bula ihe ọ bula nke ruru arú ma-ọbu nke nādighi ọcha bàra n'ọnum. 9 Ma otù olu zara nke ub͕ò abua site n'elu-igwe, si, Ihe Chineke mere ka ha di ọcha, gi onwe-gi emela ha ihe ruru arú. 10 Ewe me nka ub͕ò atọ: ewe dọlie ha nile ọzọ n'elu-igwe. 11 Ma le, n'otù oge ahu ndikom atọ guzoro n'iru ulo nke ayi nọ nime ya, ebe esiri na Sisaria ziterem ha. 12 Mọ Nsọ we gwam ka m'so ha, ghara ime onwem di iche. Umu-nna-ayi isi ndia we sokwam; ayi we ba n'ulo nwoke ahu: 13 o we kọrọ ayi otú ọ hururi mọ-ozi ka o guzoro n'ulo-ya, nāsi kwa, Ziga na Jọpa, kpọta Saimon, onye anākpọ kwa Pita; 14 onye gāgwa gi okwu ufọdu, nke agēji zọputa gi, gi onwe-gi na èzí-na-ulo-gi nile. 15 Ma mb͕e m'malitere ikwu okwu, Mọ Nsọ dakwasiri ha, dika ọ dakwasi-kwa-ra ayi na mbu. 16 M'we cheta okwu Onye-nwe-ayi, otú Ọ siri, N'ezie Jọn jiri miri me baptism; ma agēji Mọ Nsọ me unu onwe-unu baptism. 17 Ya mere ọ buru na Chineke nyere ha onyinye ra ka nke O nye-kwa-ra ayi, mb͕e ayi kwere n'Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, Mù onwem bu onye ipu ib͕ochi Chineke? 18 Ma mb͕e ha nuru ihe ndia, ha kpuchiri ọnu-ha, we nye Chineke otuto, si, Ya mere ọ bu kwa ndi mba ọzọ ka Chineke nyere nchèghari nke nēdubà na ndu. 19 Ya mere ndi b͕asara site na nkpab͕u nke putara n'ihi Stifen jeruru Finisia, na Saiprọs, na Antiọk, ha adighi-agwa onye ọ bula okwu Chineke ma-ọbughi nání ndi-Ju. 20 Ma ufọdu di n'etiti ha, ndikom nke Saiprọs na Sairini, ndi, mb͕e ha biaruru Antiọk, ha gwa kwa ndi-Grik okwu ahu, nēzisa ozi ọma nke Onye-nwe-ayi Jisus. 21 Aka Onye-nwe-ayi we so ha: oké ìgwè ndi kwere we chigharikute Onye-nwe-ayi. 22 Akukọ bayere ha we ba na nti nzukọ Kraist di na Jerusalem: ha we zipu Banabas ije rue Antiọk: 23 onye, mb͕e ọ biaruru, mb͕e ọ hu-kwa-ra amara Chineke, ọ ṅuria; o we riọ ha nile, ka ha zube n'obi-ha inọgide n'ebe Onye-nwe-ayi nọ: 24 n'ihi na ọ bu ezi nwoke, juputa kwa na Mọ Nsọ na okwukwe: ewe tukwasi oké ìgwè madu nye Onye-nwe-ayi. 25 O we pua je Tasọs ichọ Sọl: 26 mb͕e ọ chọtara ya, o we kuru ya bia Antiọk. O we rue, na ọbuná ogologo otù arọ ha zukọrọ na nzukọ Kraist, zí kwa oké ìgwè madu ihe; na ọ bu kwa n'Antiọk ka eburu uzọ kpọ ndi nēso uzọ Jisus ndi-Kristian. 27 Ma na mb͕e ahu ndi-amuma ufọdu siri na Jerusalem ridata n'Antiọk. 28 Ma otù onye nime ha, aha-ya bu Agabọs, biliri, we gosi site na Mọ Nsọ na oké unwu gaje ida n'elu-uwa dum madu bi: nke putara n'oge Klọdiọs. 29 Ndi nēso uzọ Jisus, onye ọ bula ka ihe o nwere ra, we zube izigara umu-nna nime Kraist ndi bi na Judia ihe iyere ha aka: 30 nke ha me-kwa-ra, nēzigara ndi-okenye site n'aka Banabas na Sọl.

Ọlu Ndi-Ozi 12

1 Ma dika n'oge ahu Herod, bú eze, tukwasiri aka-ya n'aru madu ufọdu nime nzukọ Kraist ime ha ihe ọjọọ. 2 O we were mma-agha b͕ue Jemes nwa-nne Jọn. 3 Ma mb͕e ọ huru na ọ di ndi-Ju utọ, o we jidekwasi Pita. Ubọchi ahu bu ubọchi achicha ekoghi-eko. 4 Mb͕e o jidesiri ya, ọ tubà ya n'ulo-nkpọrọ, we rara ya nye n'aka ndi-agha iri na isi iche ya anọ anọ; nēzube ikuputa ya nye ndi-Ju mb͕e ememe ngabiga gasiri. 5 Ya mere edebere Pita n'ulo-nkpọrọ: ma nzukọ Kraist nēkpegidesi ekpere ike nye Chineke n'ihi ya. 6 Ma mb͕e Herod gaje ikuputa ya, n'otù abali ahu Pita nāraru ura n'etiti ndi-agha abua, eji nkpọrọ abua ke ya ab͕u: ndi-nche ndi nọ n'iru ọnu-uzọ nēchebe ulo-nkpọrọ. 7 Ma le, mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi guzoro ya nso, ìhè nwu-kwa-ra n'ime-ulo nke ulo-nkpọrọ: o we tie Pita aka n'akuku, kpote ya, si, Bilie ọsọsọ. Nkpọrọ-ya abua we dapu n'aka-ya abua. 8 Mọ-ozi ahu we si ya, Ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi, yiri kwa akpukpọ-ukwu sandal gi. O we me otú ahu. Ọ we si ya, B͕okwasi uwe uku gi n'aru-gi, sọkwam. 9 O we pua, so ya; ma ọ mataghi na ọ bu ezie, bú ihe emere site n'aka mọ-ozi, kama ọ nēchè na ọ nāhu ọhù. 10 Ma mb͕e ha gasiri ndi-nche mbu na ndi-nche nke-abua, ha biaruru ọnu-uzọ-ama ígwè ahu nke esi abà nime obodo; nke meghere onwe-ya nye ha: ha we pua, gabiga n'otù uzọ ntà; ngwa ngwa mọ-ozi ahu we pua n'ebe ọ nọ. 11 Mb͕e Pita mara onwe-ya, ọ si, Ub͕u a ka m'matara n'ezie, na Onye-nwe-ayi ziputara mọ-ozi-Ya, weputam n'aka Herod, ya na ile-anya nile nke ndi-Ju. 12 Mb͕e ọ ghọtasiri ihe ahu, ọ bia rue ulo Meri nne Jọn onye akpọ-kwa-ra Mark; ebe ọtutu madu zukọrọri nēkpe kwa ekpere. 13 Ma mb͕e ọ kuru aka n'ọnu-uzọ nke ọnu-uzọ-ama, otù nwa-ab͕ọghọ, aha-ya bu Roda, biara iṅa nti. 14 Ma mb͕e ọ matara olu Pita, o megheghi ọnu-uzọ-ama n'ihi ọṅù, ma ọ b͕abàra nime ulo, kọrọ ha na Pita guzoro n'iru ọnu-uzọ-ama. 15 Ma ha siri ya, Anya adighi gi nma. Ma o nēkwusi ike na ọ bu otú a. Ha we si, Ọ bu mọ-ozi-ya. 16 Ma Pita nākugide aka n'ọnu-uzọ: mb͕e ha meghesiri, ha hu ya, ibobo we nwua ha n'aru. 17 Ma mb͕e o kpukpusiri ha aka ikpuchi ọnu-ha, ọ kọrọ ha otú Onye-nwe-ayi duputara ya-ri n'ulo-nkpọrọ. Ọ si, Kọrọ Jemes na umu-nna-ayi ihe ndia. O we pua, ga ebe di iche. 18 Ma mb͕e chi bọrọ, ọ bughi nkpasu ntà putara n'etiti ndi-agha, ihe mere Pita. 19 Mb͕e Herod chọsiri ya, ma ọ chọtaghi ya, ọ kpe ndi-nche-ya ikpé, nye iwu ka ewe dupu ha ib͕u ha. O we si na Judia ridata na Sisaria, we nọgide n'ebe ahu. 20 Ma Herod nēbu agha nke-uku megide Taia na Saidon n'obi-ya: ha we were otù obi biakute ya; mb͕e ha mesiri Blastọs eyì-ha, nke bu onye nēle ime-ulo-ndina nke eze anya, ha we riọ ka udo di n'etiti ha, n'ihi na esi n'ala nke eze ahu azù ala-ha. 21 N'ubọchi akara àkà Herod we yikwasi uwe nke eze, nọkwasi n'oche-ikpé, gwa ha okwu. 22 Ọra madu we tie nkpu, si, Ọ bu olu chi, ọ bughi kwa olu nke madu. 23 Ngwa ngwa mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi we tie ya ihe, n'ihi na ọ nyeghi Chineke otuto ahu: ikpuru we tab͕ue ya, o we kubìe ume. 24 Ma okwu Chineke nāga n'iru, nāba kwa uba. 25 Banabas na Sọl we si na Jerusalem laghachi, mb͕e ha jezuru ozi-ha, nēkuru Jọn nke akpọ-kwa-ra Mark ya na ha yikọ je.

Ọlu Ndi-Ozi 13

1 Ma ndi-amuma na ndi-ozizí di n'Antiọk, nime nzukọ Kraist di n'ebe ahu, bú Banabas, na Simeon onye anākpọ Naiga, na Lusiọs onye Sairini, na Manaen onye azùkọrọ ya na Herod, bú tetrarch, na Sọl. 2 Ma mb͕e ha nēfè Onye-nwe-ayi òfùfè, nēbu kwa ọnu, Mọ Nsọ siri, Kewaputaram Banabas na Sọl ilu ọlu nke M'kpọworo ha ka ha lua. 3 Mb͕e ahu, mb͕e ha busiri ọnu kpe kwa ekpere bikwasi kwa ha aka n'isi, ha we zipu ha. 4 Ya mere ndi ahu, ebe Mọ Nsọ zipuru ha, ha ridata na Seleusia; ha we site n'ebe ahu ba n'ub͕o je Saiprọs. 5 Mb͕e ha ruru Salamis, ha we kwusa okwu Chineke n'ulo-nzukọ nile nke ndi-Ju: ha nwe-kwa-ra Jọn dika onye nējere ha ozi. 6 Mb͕e ha gabigasiri n'agwe-etiti ahu dum rue Pafọs, ha hu otù nwoke nke bu onye-mb͕asi, onye-amuma ugha, onye-Ju, aha-ya bu Ba-Jisus; 7 onye ya na onye-isi nọ, bú Sajiọs Pọlọs, nwoke nwere nghọta. Onye ahu kpọtāra onwe-ya Banabas na Sọl, we chọ inu okwu Chineke. 8 Ma Elimas, bú onye-mb͕asi ahu, (n'ihi na otú a ka aha-ya di ma asugharia ya), nēguzogide ha, nāchọ uzọ iduhie onye-isi ahu n'okwukwe-ayi. 9 Ma Sọl, onye anākpọ kwa Pọl, ebe o juputara na Mọ Nsọ, ọ legidere ya anya, 10 si, Gi onye juputara n'aghughọ nile na ihe nile jọb͕uru onwe-ya, gi nwa ekwensu, gi onye-iro ezi omume nile, ì gaghi-arapu ikwahie uzọ nile eguzoziri nke Onye-nwe-ayi? 11 Ub͕u a, le, aka Onye-nwe-ayi di kwa n'aru gi, i gēkpu kwa ìsì, nāhughi anyanwu nwa oge. Ngwa ngwa alulu na ọchichiri dakwasiri ya; o we nējeghari nāchọ ndi gējide ya n'aka idu ya. 12 Mb͕e ahu onye-isi ahu, mb͕e ọ huru ihe meworo, o kwere, ebe ibobo ozizí nke Onye-nwe-ayi nwuru ya n'aru. 13 Pọl-hà we si na Pafọs nupu ub͕ọ, bia rue Paga di na Pamfilia: jọn we rapu ha, laghachi na Jerusalem. 14 Ma ha onwe-ha sitere na Paga gabiga, bia rue Antiọk di na Pisidia; ha we ba nime ulo-nzukọ-ha n'ubọchi-izu-ike, we nọdu ala. 15 Ma mb͕e agusiri akwukwọ iwu na ndi-amuma, ndi-isi ulo-nzukọ ahu zigara ha ozi, si, Umu-nne-ayi, ọ buru na unu nwere okwu nkasi-obi igwa ndi-ayi, kwuenu. 16 Pọl we bilie, kpukpu kwa aka, si, Ndikom nke Israel, na ndi nātu egwu Chineke, nurunu. 17 Chineke nke ndi nka, bú Israel, rọputara nna-ayi-hà, we welie ndi Israel elu mb͕e ha nọ dika ọbìa n'ala Ijipt, O were kwa ogwe-aka di elu duputa ha nime ya. 18 Oge ra ka ọgu arọ abua O we nānagide omume-ha n'ọhia. 19 Mb͕e O wedasiri mba asa n'ala Kenean, O me ka ha keta ala-ha, ihe ra ka nnù arọ na ọgu arọ abua na iri: 20 mb͕e ihe ndia gasiri O nye ha ndi-ikpé rue oge Samuel, bú onye-amuma. 21 Emesia ha riọ ka enye ha eze: Chineke we nye ha Sọl nwa Kish, nwoke nke sitere n'ebo Benjamin, onye chiri eze ọgu arọ abua. 22 Mb͕e O wepusiri ya, O welie Devid ibu eze-ha; onye Ọ b͕a-kwa-ra àmà, si, Achọtawom Devid nwa Jesi, nwoke nke di ka obim si achọ, onye gēme ihe nile M'nāchọ. 23 Site na nkpuru nwoke a ka Chineke wetara Israel Onye-nzọputa, bú Jisus, dika nkwa-Ya si di; 24 mb͕e Jọn buru uzọ kwusa baptism nke nechègari nye ndi Israel nile, mb͕e Ọ kābataghi. 25 Ma mb͕e Jọn nāb͕azu ọsọ-ya, ọ si, Gini ka unu nēchè na abum? Mu onwem abughi Ya. Kama, le, otù Onye nābia n'azum, Onye m'nēkwesighi itọpu akpukpọ-ukwu nke ukwu-Ya. 26 Umu-nnem, umu eriri Abraham, na ndi di n'etiti unu nātu egwu Chineke, ọ bu ayi onwe-ayi ka eziputara okwu nke nzọputa nka. 27 N'ihi na ndi bi na Jerusalem, na ndi-isi-ha, ebe ha nāmataghi Ya, na olu ndi-amuma nke anāgu n'ubọchi-izu-ike nile, ha mezuru ha n'ima Ya ikpé. 28 Ọ bu ezie na ha ahughi ihe ọ bula kwesiri ọnwu n'aru Ya, ma ha riọrọ Pailet ka eb͕ue Ya. 29 Mb͕e ha mezuru ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ bayere Ya, ha si n'osisi ahu wedata Ya, tọb͕ọ Ya n'ílì. 30 Ma Chineke mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie: 31 ewe me ka ha hu Ya ọtutu ubọchi, bú ndi soro Ya si na Galili rigoro Jerusalem, ndi buru ndi-Ju ndi-àmà-Ya ub͕u a. 32 Ayi onwe-ayi nēzì kwa unu ozi ọma nke nkwa ahu ekwere nna-ayi-hà, 33 na Chineke emezuwo nka n'ebe umu-ayi nọ, ebe O mere ka Jisus bilie; dika edewo-kwa-ra ya n'abù ọma nke-abua, si, Ọkparam ka Gi onwe-gi bu, Mu onwem amuwo Gi ta. 34 Ma na O mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, ọ dighi na Ọ gaje ilaghachi n'ire-uré ọzọ, O kwuwo otú a, si, M'gēnye unu ihe nile di ọcha nke kwesiri ntukwasi-obi nke ekwere Devid na nkwa. 35 N'ihi na Ọ nāsi kwa n'abù ọma di iche, I gaghi-enye Onye nke Gi di ọcha n'obi ka Ọ hu ire-uré. 36 N'ihi na Devid, mb͕e o jesiri ọb͕ọ-ya ozi, o sitere n'ìzù Chineke da n'ura ọnwu, ewe tọb͕ọ ya n'ebe nna-ya-hà nọ, o we hu ire-uré: 37 ma Onye ahu Chineke mere ka O bilie ahughi ire-uré. 38 Ya mere maranu nka, umu-nnem, na anēsite n'ọnu Onye a kwusa nb͕aghara nmehie nile nye unu: 39 ọ bu kwa nime Onye a ka anāgu onye ọ bula nke kwere na Ya n'onye ezi omume n'ihe nile, nke anāpughi igu unu na ndi ezi omume na ha nime iwu Moses. 40 Ya mere lezienu anya, ka ihe ahu ghara ibiakwasi unu, nke ekwuworo n'akwukwọ ndi-amuma, si, 41 Lenu, ndi-nlelì-anya, ka o ju kwa unu anya, ka ekpochapu kwa unu; N'ihi na ọlu ka Mu Onwem nālu n'ubọchi-unu, Ọlu unu nāgaghi-ekwe ma-ọli ọ buru na onye ọ bula kọrọ unu akukọ-ya. 42 Mb͕e ha nāpu, ha we riọ ka agwa ha okwu ndia n'ubọchi-izu-ike soni. 43 Ma mb͕e nzukọ ahu lasasiri, ọtutu madu n'etiti ndi-Ju, na n'etiti ndi nēso uzọ ndi-Ju ndi nātu egwu Chineke, soro Pọl na Banabas: ndi nāgwa ha okwu, nēme kwa ha ka ha kweye inọgide n'amara nke Chineke. 44 Ma n'ubọchi-izu-ike soni ọ fọduru ihe ntà ka obodo ahu nile zukọ inu okwu Chineke. 45 Ma mb͕e ndi-Ju huru ìgwè madu ahu, ha juputara n'ekworo, we nēkwugide ihe nile Pọl nēkwu, ha nēkwulu kwa ha. 46 Pọl na Banabas we kwuwa okwu, si, Ọ di nkpà ka eburu uzọ gwa unu okwu Chineke. Ebe unu nēnupu ya n'aru-unu, nekpe kwa onwe-unu ndi nēkwesighi ndu ebighi-ebi, le, ayi gaje ichighari gwa ndi mba ọzọ okwu. 47 n'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi nyeworo ayi iwu, si, Edebewom I ka I buru ìhè nke mba nile, Ka I we di inye nzọputa rue nsọtu uwa. 48 Ma mb͕e ndi mba ọzọ nuru nka, ha ṅuria, nye kwa okwu Chineke otuto: ha we kwere na Jisus, ka ha ra, bú ndi edoro inata ndu ebighi-ebi. 49 Ewe nēbu okwu Onye-nwe-ayi jezu ala ahu dum. 50 Ma ndi-Ju kwaliri ndinyom nātu egwu Chineke, bú ndi anāsọpuru, na ndi-isi obodo ahu, ha we kpalie nsob͕u megide Pọl na Banabas, we chupu ha n'ókè-ala-ha. 51 Ma ha rupuru ájá nke ukwu-ha megide ha, we bia rue Aikọniọm. 52 Ndi nēso uzọ Jisus we juputa n'ọṅù na Mọ Nsọ.

Ọlu Ndi-Ozi 14

1 O we rue n'Aikọniọm, na ha abua bàkọrọ n'ulo-nzukọ nke ndi-Ju, we kwue okwu n'uzọ nke mere ka oké ìgwe madu, ma ndi-Ju ma ndi-Grik, kwere na Jisus. 2 Ma ndi-Ju ndi nēkweyeghi kpaliri nkpuru-obi ndi mba ọzọ, me ka ha jọ njọ n'ebe umu-nna nime Kraist nọ. 3 Ya mere ha nọgidere n'ebe ahu oge di anya, nēkwuwa okwu nime Onye-nwe-ayi, Onye nāb͕ara okwu amara-Ya àmà, ebe Ọ nēnye ka eme ihe-iriba-ama na ọlu-ebube di iche iche site n'aka-ha. 4 Ma ọra obodo ahu kewara: ufọdu we nọ n'akuku ndi-Ju, ufọdu nọ kwa n'akuku ndi-ozi Jisus. 5 Mb͕e ndi mba ọzọ na ndi-Ju kwa, ha na ndi-isi-ha, nukọtara ime ha ihe-ihere, na itu ha nkume, 6 ha we mata, b͕alaga n'obodo nke Laikaọnia, bú Listra na Dabe, na ala di ha buruburu: 7 n'ebe ahu ka ha nēzisa kwa ozi ọma. 8 Ma na Listra otù nwoke nānọdu ala, nke ukwu-ya abua nēnweghi ike, bú onye-ngwurọ site n'afọ nne-ya, onye ọ dighi mb͕e ọ bula o jereri ije. 9 Onye a nuru Pọl ka o nēkwu: onye, ebe o legidere ya anya, ebe ọ hu-kwa-ra na o nwere okwukwe agēji zọputa ya, 10 o were oké olu si, Bilie, guzo ọtọ n'ukwu-gi abua. O we wulie je kwa ije. 11 Mb͕e ìgwè madu nile huru ihe Pọl mere, ha welie olu-ha, nāsi n'asusu Laikaọnia, Chi-ayi ridatakuru ayi n'oyiyi madu. 12 Ha we kpọ Banabas, Jupita; kpọ kwa Pọl, Makuri, ebe ya onwe-ya bu onye-isi nēkwu okwu. 13 Onye-nchu-àjà nke Jupita, nke ulo nsọ ya di n'iru obodo ahu, we sekputa ehi weta kwa okoko-osisi n'ọnu-uzọ-ama obodo, ya na ìgwè madu ahu we chọ ichu àjà. 14 Ma mb͕e ndi-ozi ahu, bú Banabas na Pọl, nuru ya, ha dọwa uwe-ha, we pua b͕abà n'etiti ìgwè madu ahu, nēti nkpu, 15 nāsi, Ndikom, gini mere unu nēme ihe ndia? Ayi onwe-ayi bu kwa madu yiri unu n'aru-ayi, ayi nēzì kwa unu ozi ọma, ka unu si n'ihe-efu ndia chigharikute Chineke Nke di ndu, Onye kère elu-igwe na ala na oké osimiri, na ihe nile di ha nime: 16 Onye n'ọb͕ọ nile gara aga kwere ka mba nile nāga n'uzọ nile nke aka ha. 17 Otú ọ di, Ọ rapughi Onwe-ya nēnweghi ihe-àmà, ebe Ọ nēme ezi ihe, nēnye kwa unu miri-ozuzo na oge nkpuru site n'elu-igwe, nēmeju obi-unu n'ihe-ọzùzù na ọṅù. 18 Ma n'ikwu okwu ndia ọ di ha ike ib͕ochi ìgwè madu nile ka ha ghara ichu àjà nye ha. 19 Ma ndi-Ju siri n'Antiọk na Aikọniọm bia rue ebe ahu: mb͕e ha rafusiri ìgwè madu nile, ha tua Pọl nkume, dọkpupu ya n'azu abodo, nēchè na ọ nwuru anwu. 20 Ma mb͕e ndi nēso uzọ Jisus guzoro ya buruburu, o bilie, ba nime obodo: n'echi-ya ya na Banabas we pua ga Dabe. 21 Mb͕e ha zisasiri ozi ọma gwa ndi obodo ahu, me kwa ọtutu madu ka ha buru ndi nēso uzọ Jisus, ha laghachi na Listra, na Aikọniọm, na Antiọk, 22 nēme ka nkpuru-obi ndi nēso uzọ Jisus guzosie ike, nāriọ ha ka ha nọgide n'okwukwe-ayi, nēgosi kwa na ayi aghaghi isite n'ọtutu nkpab͕u ba n'ala-eze Chineke. 23 Mb͕e ha rọputasiri ndi-okenye nime nzukọ Kraist nile n'otù n'otù nye ha, were kwa ọbubu-ọnu kpe ekpere, ha we rara ha nye n'aka Onye-nwe-ayi, bú Onye ha kwereri na Ya. 24 Ha we gabiga n'etiti Pisidia, bia rue Pamfilia. 25 Mb͕e ha kwusiri okwu Chineke na Paga, ha ridata n'Atalaia; 26 ha we si n'ebe ahu ba n'ub͕ọ je Antiọk, nke esitereri na ya rara ha nye n'amara nke Chineke ilu ọlu nke ha luzuru. 27 Mb͕e ha ruru, me kwa ka nzukọ Kraist zukọta, ha we kọrọ ha ihe nile, ka ha ra, bú nke Chineke soro ha me, kọ-kwa-ra ha na O meghereri ọnu-uzọ okwukwe nye ndi mba ọzọ. 28 Ha na ndi nēso uzọ Jisus we nọgide ọ bughi nwa oge.

Ọlu Ndi-Ozi 15

1 Madu ufọdu we si na Judia ridata we zí umu-nna nime Kraist ihe, si, Ọ buru na ebìghi unu úgwù dika ọme-n'ala nke Moses nyere si di, apughi izọputa unu. 2 Ma mb͕e nkewa na ajuju nādighi ntà diri Pọl na Banabas imegide ha, ndi Kraist we dozie ka Pọl na Banabas, na ufọdu ndi ọzọ n'etiti ha, rigoro Jerusalem jekuru ndi-ozi na ndi-okenye bayere ajuju a. 3 Ya mere, mb͕e nzukọ Kraist dupusiri ha n'ije-ha, ha gabigara n'etiti Finisia, gabiga kwa n'etiti Sameria, nākọ nchighari nke ndi mba ọzọ: ha nēme kwa ka oké ọṅù diri umu-nna nime Kraist nile. 4 Mb͕e ha ruru Jerusalem, nzukọ Kraist na ndi-ozi na ndi-okenye we nara ha nke-ọma, ha we kọrọ ha ihe nile, ka ha ra, bú nke Chineke soro ha me. 5 Ma ufọdu nime irọ-òtù ndi-Farisi ndi kwere na Jisus biliri, si, Aghaghi ibì ha úgwù, na inye ha iwu ka ha debe iwu Moses. 6 Ndi-ozi na ndi-okenye we zukọ ile okwu a. 7 Mb͕e ha juritarari onwe-ha ọtutu ajuju, Pita we bilie, si ha, Umu-nnam, unu onwe-unu mara na site n'ubọchi mbu Chineke rọputara n'etiti unu, ka ndi mba ọzọ we site n'ọnum nu okwu nke ozi ọma ahu, kwere kwa. 8 Chineke, Onye mara obi madu, we b͕ara ha àmà, ebe O nyere ha Mọ Nsọ, dika Ọ nye-kwa-ra ayi onwe-ayi; 9 ọ dighi kwa ókè Ọ kpara n'ab͕ata ayi na ha, ebe O mere ka obi-ha di ọcha site n'okwukwe. 10 Ya mere, ub͕u a, gini mere unu nānwa Chineke, n'ikoye yoke n'olu ndi nēso uzọ Jisus, nke ma nna-ayi-hà ma ayi onwe-ayi nēnweghi ike ibūru? 11 Kama ayi kewere na agāzọputa ayi site n'amara Onye-nwe-ayi Jisus, n'otù aka ahu dika ha onwe-ha. 12 Ọra ha nile we kpuchie ọnu-ha; ha we nuru okwu Banabas na Pọl ka ha nakọ akukọ ihe-iriba-ama na ọlu-ebube nile, ka ha ra, bú nke Chineke mere n'etiti ndi mba ọzọ site n'aka-ha. 13 Mb͕e ha kpuchiri ọnu-ha, Jemes we za, si, Umu-nnam, nurunu olum: 14 Simeon kọrọ otú Chineke buru uzọ leta ndi mba ọzọ, isi n'etiti ha weputara aha-Ya otù ndi. 15 Nka na okwu ndi-amuma nwe-kwa-ra otù olu; dika edeworo n'akwukwọ nsọ, si, 16 Mb͕e ihe ndia gasiri M'gālaghchi, M'gāma kwa ulo-ikwū nke Devid ọzọ, nke daworo ada; Ọ bu kwa ebe-ya nile akwaturu akwatu ka M'gēwu ọzọ, M'gēme kwa ka o guzozie ọzọ: 17 Ka ndi fọduru n'etiti madu we chọ Onye-nwe-ayi, Ha na mba nile, ndi aguru aham, 18 Ka Onye-nwe-ayi kwuru, Onye nēme ka amara ihe ndia site na nmalite oge a. 19 N'ihi nka uche nke mu onwem bu, ka ayi ghara isob͕u ndi si n'etiti ndi mba ọzọ chigharikute Chineke: 20 kama ka ayi zigara ha akwukwọ-ozi, ka ha rapu ihe ruru árú nke arusi nile, na ikwa-iko, na anu anyab͕uru anyab͕u, na ọbara. 21 N'ihi na Moses site n'ọb͕ọ mbu nile nwere n'obodo dum ndi nēkwusa ya, ebe anāgu ya n'ulo-nzukọ nile ubọchi-izu-ike dum. 22 Mb͕e ahu ọ di ndi-ozi na ndi-okenye nma, ha na nzukọ Kraist dum, irọputa ndikom ufọdu nime ha, na iziga ha n'Antiọk, ha na Pọl na Banabas; bú Judas anākpọ Basabas, na Sailas, ndikom bu ndi-isi n'etiti umu-nna nime Kraist: 23 ha site-kwa-ra n'aka-ha de akwukwọ, si, Ndi-ozi na umu-nna-unu, bú ndi-okenye, nēdegara umu-nna-ayi akwukwọ, bú ndi sitere na ndi mba ọzọ, ndi bi n'Antiọk na Siria na Silisia, ayi nēkele unu: 24 Ebe ayi nuru na ufọdu ndi siri n'etiti ayi pua were okwu me ka obi lọ unu miri, nēmebi nkpuru-obi-unu; bú ndi ayi nēnyeghi ihe ọ bula n'iwu; 25 ọ di ayi nma, ebe ayi biaworo nwe otù obi, irọputa ndikom na iwere ha zigara unu, ha na Banabas na Pọl, ndi ayi huru n'anya, 26 ndi raraworo ndu-ha nye n'ihi aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist. 27 Ya mere ayi ezitewo Judas na Sailas, ndi ha onwe-ha gākọ-kwa-ra unu otù ihe ndia n'okwu ọnu. 28 N'ihi na ọ di Mọ Nsọ nma, di kwa ayi onwe-ayi nma, ka ayi ghara ibo unu ibu arọ́ kari ihe ndia di nkpà: 29 ka unu rapu ihe nile achuru n'aja nye arusi, na ọbara, na anu anyab͕uru anyab͕u, na ikwa-iko; ọ buru na unu edebe onwe-unu ghara imetu ihe ndia aka, ọ gādiri unu nma. Jisienu ike. 30 Ya mere, mb͕e ezipusiri ha, ha ridatara n'Antiọk; mb͕e ha mesiri ka ọra madu zukọ, ha nye ha akwukwọ-ozi ahu. 31 Mb͕e ha gusiri ya, ha ṅuria n'ihi nkasi-obi di ya. 32 Judas na Sailas, ebe ha onwe-ha bu kwa ndi-amuma, ha we were ọtutu okwu kasie umu-nna ahu obi, me kwa ka obi-ha guzosie ike. 33 Mb͕e ha nọdusiri n'ebe ahu oge ufọdu, ewe si n'ebe umu-nna ahu nọ zilaga ha n'udo lakuru ndi ziputara ha-ri. 34 Ma otú ọ di, ọ di Sailas nma ka ọ nọgide n'ebe ahu. 35 Ma Pọl na Banabas nọgidere n'Antiọk, nēzí nēzisa kwa ozi ọma, bú okwu nke Onye-nwe-ayi, ha na ọtutu ndi ọzọ kwa. 36 Mb͕e ubọchi ufọdu gasiri Pọl we si Banabas, Ka ayi jeghachi ub͕u a leta umu-nna-ayi n'obodo nile n'otù n'otù ebe ayi kwusara okwu Onye-nwe-ayi, ka ayi we le otú ha nēme. 37 Banabas we zube ikuru kwa Jọn, onye anākpọ Mark, ka ya na ha yikọ je. 38 Ma ọ dighi Pọl nma ka ha kuru onye ahu ka ya na ha yikọ je, bú onye si na Pamfilia rapu ha laghachi, ghara iso kwa ha je ọlu-ha. 39 Oké iwe we puta n'etiti ha, nke mere ka ha kewa otù onye n'ebe ibe-ya nọ, Banabas we kuru Mark nye onwe-ya, we ba n'ub͕ọ je Saiprọs; 40 ma Pọl rọputara Sailas, we pua, mb͕e umu-nna nime Kraist rarasiri ya nye n'amara Onye-nwe-ayi. 41 O we gabiga nime Siria na Silisia, nēme ka nzukọ Kraist guzosie ike.

Ọlu Ndi-Ozi 16

1 O we biaru kwa Dabe na Listra: ma le, otù onye nke nēso uzọ Jisus nọ n'ebe ahu, aha-ya bu Timọti, nwa nke otù nwanyi Ju onye kwere na Jisus; ma nna-ya bu onye-Grik. 2 Umu-nna nime Kraist ndi bi na Listra na Aikọniọm b͕ara onye ahu ezi àmà. 3 Nwoke a ka Pọl chọrọ ka o so ya pua; o we were ya bì ya úgwù n'ihi ndi-Ju ndi nọ n'ebe ahu: n'ihi na ha nile matara na nna-ya bu onye-Grik. 4 Mb͕e ha nāgabiga n'obodo nile, ha we nēnye n'aka-ha iwu ahu idebe, bú nke ndi-ozi na ndi-okenye nọ na Jerusalem nyereri. 5 Ya mere anēnye nzukọ Kraist ike n'okwukwe-ayi, ọnu-ọgugu-ha nābabiga kwa uba ókè kwa-ubọchi. 6 Ha we nāgabiga n'ala Frijia na Galetia, ebe Mọ Nsọ b͕ochiri ha ikwu okwu Chineke n'Esia; 7 mb͕e ha biara na ncherita-iru Misia, ha we nwa iga na Bitinia; ma Mọ nke Jisus ekweghi ha; 8 ha we gabiga akuku Misia, we ridata na Troas. 9 Ewe me ka Pọl hu ọhù n'abali: Otù nwoke, bú onye Masedọnia, nēguzo, nāriọ ya, si, Gabita na Masedọnia, yere ayi aka. 10 Mb͕e ọ husiri ọhù ahu, ngwa ngwa ayi we chọ uzọ ipu ka ayi ba na Masedọnia, ebe ayi sikwutara n'obi-ayi na Chineke kpọrọ ayi-ri izì ha ozi ọma. 11 Ya mere ayi siri na Troas nupu ub͕ọ, we ga otù iru rue Samọtresi, n'echi-ya ayi we rue Neapọlis; 12 ayi we site n'ebe ahu ga rue Filipai, nke bu otù obodo nke Masedọnia, obodo mbu nke akuku ahu, buru kwa colony nke Rom: ayi we nānọgide n'obodo ahu ubọchi ufọdu. 13 N'ubọchi-izu-ike ayi we pua n'ọnu-uzọ-ama obodo ga n'usọ otù osimiri, ebe ayi chère na ebe ekpere di; ayi we nọdu ala, we gwa ndinyom ndi b͕akọrọ okwu. 14 Otù nwanyi we nu okwu-ayi, aha-ya bu Lidia, onye nēre ihe eji esiji ákwà ododo, onye obodo Tayataira, onye nātu egwu Chineke: Onye-nwe-ayi we meghe obi-ya, iṅa nti n'ihe nile Pọl nēkwu. 15 Mb͕e emere ya na èzí-na-ulo-ya baptism, ọ riọ ayi, si, Ọ buru na unu atulewo na abum onye kwere n'Onye-nwe-ayi, batanu n'ulom, nọgide n'ebe ahu. O we rugide ayi. 16 O we rue, mb͕e ayi nāga ebe ekpere, na otù nwa-ab͕ọghọ onye nwere mọ nke anākpọ Paiton zutere ayi, onye nēwetara ndi-nwe-ya ọtutu urù site n'ibu amuma ugha. 17 Nwanyi a nēso ayi na Pọl, nēti nkpu, si, Madu ndia bu ndi-orù Chineke Onye kachasi ihe nile elu, ndi nēkwusara unu uzọ nzọputa. 18 Ma nka ka ọ nēme ọtutu ubọchi. Ma Pọl, ebe ike gwuru ya nọ̄, o chighariri, si mọ ahu, Anamenye gi iwu n'aha Jisus Kraist ka i si nime ya puta. O we puta n'otù oge hour ahu. 19 Ma mb͕e ndi-nwe-ya huru na olile-anya nke urù-ha alawo, ha jidere Pọl na Sailas, we dọkpuru ha ba n'ọma-ahia n'iru ndi-isi, 20 mb͕e ha kutasiri ha n'iru ndi-ikpé, ha si, Ndikom ndia, ebe ha bu ndi-Ju, ha nēme ka obi lọ ndi obodo-ayi miri nke-uku, 21 ha nēkwusa kwa ọme-n'ala nke nēzighi ezi n'iwu ka ayi nara, ma-ọbu ime, ebe ayi bu ndi Rom. 22 Ìgwè ndi ahu we guzo ọtọ n'otù imegide ha: ndi-ikpé we dọwapu uwe-ha, nye kwa iwu ka apia ha utari. 23 Mb͕e ha tisiri ha ọtutu ihe-otiti, ha tubà ha n'ulo-nkpọrọ, nēnye onye-nche ulo-nkpọrọ iwu ka ọ debe ha nke-ọma: 24 onye, ebe enyere ya-ri iwu di otú a, ọ tubàra ha nime ulo-nkpọrọ di nime, kpọsie ha ọtọsi ike n'ukwu. 25 Ma dika n'etiti abali Pọl na Sailas nēkpe ekpere nābùku kwa Chineke abù, ndi-nkpọrọ we nēge nti n'olu-ha; 26 na mberede oké ala-ọma-jijiji di, nke mere ka ntọ-ala ulo-nkpọrọ ma jijiji: ngwa ngwa ọnu-uzọ nile we meghe; ab͕u ndi-nkpọrọ nile tọpu-kwa-ra. 27 Onye-nche ulo-nkpọrọ, ebe emere ka ọ teta n'ura, ebe ọ hu-kwa-ra ọnu-uzọ ulo-nkpọrọ ka ha megheworo, o we miputa mma-agha-ya, gaje ib͕u onwe-ya, ebe ọ nēchè na ndi-nkpọrọ ab͕apuwori. 28 Ma Pọl were oké olu ti nkpu, si, Emerula onwe-gi aru: n'ihi na ayi nile nọ n'ebe a. 29 O we riọ ka eweta ọku, o we mabà nime, da n'iru Pọl na Sailas, ka aru nāma ya jijiji, 30 o we kuputa ha, si, Ndi-nwe-ayi, gini di nkpà ka m'me ka ewe zọputam? 31 Ha we si, Kwere n'Onye-nwe-ayi Jisus, agāzọputa kwa gi, gi onwe-gi na èzí-na-ulo-gi. 32 Ha we gwa ya okwu Onye-nwe-ayi, ya na ndi nile nọ n'ulo-ya. 33 O we kuru ha n'otù oge hour nke abali ahu, sa ọnyá ihe-otiti-ha; ngwa ngwa ewe me ya baptism, ya onwe-ya na ndi-ya nile. 34 O we kugo ha n'ulo-ya, dọba ihe-oriri n'iru ha, obi nātọ kwa ya utọ nke-uku, ya na èzí-na-ulo-ya nile, ebe o kwere Chineke. 35 Ma mb͕e chi bọrọ, ndi-ikpé zitere ndi-ọchi-utari-ha, si, Rapu ndikom ahu ka ha la. 36 Onye-nche ulo-nkpọrọ ahu we kọrọ Pọl okwu ndia, si, Ndi-ikpé ezitewo ka arapu unu la: ya mere putanu ub͕u a, la kwa n'udo. 37 Ma Pọl siri ha, Ha piara ayi ihe n'iru ọra madu, nāmaghi ayi ikpé, ọ bu ezie na ayi bu ndi Rom, ha we tubà ayi n'ulo-nkpọrọ; hà nāchupu kwa ayi ub͕u a na nzuzo? ha agaghi-eme ya ma-ọli; kama ka ha onwe-ha bia duputa ayi. 38 Ndi-ọchi-utari ahu we kọrọ ndi-ikpé okwu ndia: ha we tua egwu, mb͕e ha nuru na ha bu ndi Rom; 39 ha we bia riọ ha; mb͕e ha duputasiri ha, ha we kpere ha ka ha si n'obodo-ha pua. 40 Ha we si n'ulo-nkpọrọ-ahu puta, ba n'ulo Lidia: mb͕e ha husiri umu-nna nime Kraist, ha kasie ha obi, we pua.

Ọlu Ndi-Ozi 17

1 Ma mb͕e ha gabigasiri n'Amfipọlis na Apọlonia, ha biaruru Tesalọnaika, ebe ulo-nzukọ ndi-Ju di: 2 Pọl dika ọ nēme mb͕e dum, we bakuru ha, ogologo ubọchi-izu-ike atọ ọ nāgwa kwa ha okwu site n'ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, 3 nēmeghe ha, nēche kwa n'iru ndi ahu, na Kraist-ha aghaghi ihu ahuhu, na isi na ndi nwuru anwu bilie; nēgosi kwa na Jisus nka, Onye mu onwem nēkwusara unu, ka o kwuru, bu Kraist ahu. 4 Ewe me ka ufọdu nime ha kweye, ha we dayere Pọl na Sailas; ha na oké ìgwè madu n'etiti ndi-Grik ndi nātu egwu Chineke, ọ dighi kwa ndinyom ole-na-ole nime ndinyom ndi bu ndi-isi dayere ha. 5 Ma ndi-Ju, ebe ha nēkwo ekworo, ha kuru ajọ ndikom ufọdu nime ndi nēguzo n'efu n'ọma-ahia ka ha so ha, ha we kpọkọta ìgwè madu, me ka obodo ahu tua ùzù; ha we biakwasi ulo Jeson, chọ uzọ ikuputa ha n'iru ọra madu. 6 Ma mb͕e ha nāchọtaghi ha, ha dọkpuru Jeson na umu-nna nime Kraist ufọdu ga n'iru ndi-isi obodo, nēti nkpu, si, Ndia, bú ndi kpùru elu-uwa dum madu bi iru, ha eruwo kwa n'ebe a; 7 ndi Jeson kpọbataworo: ndia nile nēmegide kwa iwu nile nke Sisa, ebe ha nāsi na Eze di iche di, bú Jisus. 8 Ha we me ka obi lọ ìgwè madu ahu na ndi-isi obodo miri, mb͕e ha nuru ihe ndia. 9 Mb͕e ha mesiri ka Jeson na ndi fọduru nọ n'aka-mbe, ha we rapu ha ka ha la. 10 Ngwa ngwa umu-nna nime Kraist we zipu Pọl na Sailas n'abali igaru Beria: mb͕e ha ruru ebe ahu, ha ba nime ulo-nzukọ nke ndi-Ju. 11 Ma ndia ka ndi bi na Tesalọnaika nma n'obi, ebe ha were obi di ọku nile nara okwu ahu nke-ọma, nēnyocha ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ kwa-ubọchi, ma ihe ndia di otú a. 12 Ya mere ọtutu madu nime ha kwere na Jisus; ọ dighi kwa ole-na-ole kwere n'etiti ndinyom Grik ndi anāsọpuru, na n'etiti ndikom. 13 Ma mb͕e ndi-Ju nke Tesalọnaika mara na Pọl nēkwusa kwa okwu Chineke na Beria, ha bia-kwa-ra ebe ahu, nākpali ìgwè madu nile, nēme kwa ka obi lọ ha miri. 14 Mb͕e ahu umu-nna nime Kraist we zipu Pọl ngwa ngwa iga rue oké osimiri: ma Sailas na Timọti nọgidere n'ebe ahu. 15 Ma ndi duru Pọl kuru ya rue Atens: mb͕e ha natasiri iwu inye Sailas na Timọti ka ha biakute ya ọsọsọ ka ike-ha ra, ha we la. 16 Ma mb͕e Pọl nēche ha n'Atens, oké iwe nēwe mọ-ya nime ya, mb͕e ọ huru ka obodo ahu juputara n'arusi. 17 Ya mere ọ nāgwa ndi-Ju na ndi nātu egwu Chineke okwu n'ulo-nzukọ, ọ nāgwa kwa ndi ọ nēzute n'ọma-ahia okwu kwa-ubọchi. 18 Ufọdu kwa nime ndi-Epikurean na ndi-Stoik, bú ndi nāhu amam-ihe n'anya, we zute ya. Ufọdu we si, Gini ka onye-ekwukwu a nāchọ ikwu? ndi ọzọ nāsi kwa, Ọ di ka onye nēkwusa ndi-mọ nke ala ọzọ: n'ihi na ọ nēzisa ozi ọma nke Jisus na nbilite-n'ọnwu-Ya. 19 Ha we jide ya, kuru ya je n'iru Areọpagọs, si, Àyi puru ima ihe ozizí ọhu nka bu, nke i nēkwu? 20 N'ihi na i nēweta na nti-ayi ihe ufọdu nke ala ọzọ: ya mere ayi nēzube ima isi ihe ndia. 21 (Ma ndi Atens nile na ndi ala ọzọ ndi nọ dika ọbìa n'ebe ahu enweghi oghere ime ihe ọzọ di iche, ma-ọbughi ikwu ma-ọbu inu ihe dikariri ọhu. ) 22 Pọl we guzo n'etiti Areọpagọs, si, Ndikom nke Atens, n'ihe nile ahuwom na unu nāsọpuru ndi-mọ-unu nke-uku. 23 N'ihi na mb͕e m'nāgabiga, nēkiri kwa ihe di iche iche unu nāsọpuru, m'we hu otù ebe-ichu-àjà nke edekwasiri ihe a n'elu ya, ENYERE CHI NKE ANĀMAGHI AMA. Ya mere ihe unu nāsọpuru nāmaghi ama, nka ka mu onwem nēkwusara unu. 24 Chineke Onye kère uwa na ihe nile di nime ya, ebe Ọ bu Onye-nwe elu-igwe na ala, Ya onwe-ya adighi-ebi n'ulo nsọ eji aka wu; 25 ejighi kwa aka madu jere ya ozi, dika o nwere ihe ọ bula di Ya nkpà, ebe Ya onwe-ya nēnye madu nile ndu, na ume, na ihe nile; 26 O we site n'otù onye kè mba nile n'otù n'otù nke madu, ka ha biri n'elu uwa nile, mb͕e O debesiri oge-ha akaworo àkà na ókè nile nke ebe-obibi-ha; 27 ka ha we chọ Chineke, ma eleghi anya ha gāsọ ìsì, we chọta Ya, ọ bu ezie na Ọ nọghi n'ebe di anya n'aru onye ọ bula nime ayi: 28 n'ihi na ọ bu nime Ya onwe-ya ka ayi nādi ndu, nējeghari kwa, nādi kwa; dika ufọdu ọbuná nime ndi nke unu ndi nēme abù kwuworo, si, N'ihi na ayi bu kwa ndi Ọ muru. 29 Ya mere ebe ayi bu ndi Chineke muru, o kwesighi ka ayi nēchè na Ihe akpọrọ Chineke yiri ọla-edo, ma-ọbu ọla-ọcha, ma-ọbu nkume, ihe apiri api site na ǹkà na ihe di n'obi madu. 30 Ya mere Chineke lefuru oge nile nke amaghi-ihe anya; ma ub͕u a Ọ nāgwa madu ka ha nile chègharia n'ebe nile: 31 ebe O debeworo otù ubọchi, nke Ọ gēkpe elu-uwa dum madu bi ikpé n'ezi omume nime ya site n'aka otù Nwoke Ọ kara àkà; O nye-kwa-ra madu nile ihe ha gēji kwere nka, ebe Ọ mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie. 32 Ma mb͕e ha nuru okwu bayere nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu, ufọdu were ya me ihe-ọchì; ma ndi ọzọ siri, Ayi gānu kwa olu-gi bayere nka ọzọ. 33 Otú a ka Pọl siri n'etiti ha pua. 34 Ma ndikom ufọdu rapara n'aru-ya, we kwere na Jisus: n'etiti ha Daiọnisiọs onye Areọpagọs di kwa, na otù nwanyi, aha-ya bu Damaris, ha na ndi ọzọ.

Ọlu Ndi-Ozi 18

1 Mb͕e ihe ndia gasiri o si n'Atens pua, bia rue Kọrint. 2 O we hu otù onye-Ju, aha-ya bu Akwila, onye Pọntọs n'ọmumu-ya, onye siworori n'Itali bia ọhu, ya na nwunye-ya Prisila, n'ihi na Klọdiọs nyereri iwu ka ndi-Ju nile si na Rom pua: o we biakute ha; 3 n'ihi na ya na ha nālu otù ọlu-ǹkà ahu, ya na ha we nọgide, nālu kwa ọlu; n'ihi na ọlu-ǹkà-ha bu ikpa ákwà ulo-ikwū. 4 O nēkwu kwa okwu n'ulo-nzukọ ubọchi-izu-ike nile n'otù n'otù, we nēme ka ndi-Ju na ndi-Grik kweye. 5 Ma mb͕e Sailas na Timọti si na Masedọnia ridata, okwu Chineke nēb͕u Pọl nb͕u n'obi, ọ nāgwasi ndi-Ju ike na Jisus bu Kraist-ha. 6 Ma mb͕e ha nēdo onwe-ha n'usoro imegide ya, nēkwulu kwa ya, o fecha uwe-ya, si ha, Ọbara-unu di n'isi-unu; mu onwem di ọcha: site n'ub͕u a m'gāgakuru ndi mba ọzọ. 7 O we si n'ebe ahu pua, ba n'ulo otù onye, aha-ya bu Taitọs Justọs, onye nāsọpuru Chineke, onye ulo-ya di ulo-nzukọ, ahu ezi nso. 8 Krispọs, onye-isi ulo-nzukọ, we kwere n'Onye-nwe-ayi, ya na èzí-na-ulo-ya dum; ọtutu madu n'etiti ndi Kọrint we kwere mb͕e ha nuru, ewe me ha baptism. 9 Onye-nwe-ayi we site n'ọhù gwa Pọl okwu n'abali, si, Atula egwu, kama nēkwu, ekpuchi-kwa-la ọnu-gi: 10 n'ihi na Mu onwem nọyere gi, ọ dighi kwa onye ọ bula gādakwasi gi ime gi ihe ọjọ: n'ihi na enwerem ọtutu madu n'obodo a. 11 O we nọdu n'ebe ahu otù arọ na ọnwa isi, nēzí okwu Chineke n'etiti ha. 12 Ma mb͕e Galio bu onye-isi nke Akaia, ndi-Ju were otù obi guzo imegide Pọl, we kuta ya n'iru oche-ikpé, 13 si, Onye a nārafu madu ka ha sọpuru Chineke n'uzọ megidere iwu-ayi. 14 Ma mb͕e Pọl gaje isaghe ọnu-ya, Galio siri ndi-Ju, Asi na ọ bu okwu nmejọ ma-ọbu ajọ ihe jọb͕uru onwe-ya, unu ndi-Ju, ọ gēkwesi ka m'nagide unu: 15 ma ọ buru na ha bu ajuju bayere okwu-ọnu di iche iche na aha di iche iche na iwu nke aka unu, unu onwe-unu le ha anya; mu onwem ezubeghi ibu onye-ikpé okwu ndia. 16 O we chupu ha n'iru oche-ikpé-ya. 17 Ha nile we jide Sostenis, bú onye-isi ulo-nzukọ, tie ya ihe n'iru oche-ikpé ahu. Ọ dighi kwa ihe ọ bula n'ihe ndia meturu Galio n'obi. 18 Mb͕e Pọl nọgidesiri ọtutu ubọchi ọzọ, ọ kele umu-nna nime Kraist ekele ikpe-azu, we si n'ebe ahu ba n'ub͕ọ ije Siria, Prisila na Akwila soro kwa ya; mb͕e ọ kpachasiri agiri-isi-ya na Kenkrei: n'ihi na ọ kwereri Chineke nkwa. 19 Ha we rue Efesọs, o we rapu ha n'ebe ahu: ma ya onwe-ya batara n'ulo-nzukọ-ha, we gwa ndi-Ju okwu. 20 Ma mb͕e ha kpere ya ka ọ nọgide oge dikariri anya, o kweghi; 21 ma mb͕e o kelesiri ha ekele ikpe-azu, si kwa, M'gālaghachikute unu ọzọ, ma Chineke kwe, o si n'Efesọs nupu ub͕ọ. 22 Mb͕e ọ puru n'ub͕ọ na Sisaria, ọ rigo kele nzukọ Kraist, we ridata n'Antiọk. 23 Mb͕e ọ nọsiri n'ebe ahu oge ufọdu, ọ pua, we nāgabiga nime ala Galetia na Frijia n'usoro, nēme ka ndi nile ndi nēso uzọ Jisus guzosie ike. 24 Ma otù onye-Ju, aha-ya bu Apọlos, onye Aleksandria n'ọmumu, nke bu onye-ọ̀kà-okwu, biaruru Efesọs; ọ di kwa ike n'ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ. 25 Ejiri okwu-ọnu zí nwoke a uzọ Onye-nwe-ayi; ebe ọ di ọku na mọ-ya, o we nēkwu nēzí kwa nke-ọma ihe nile bayere Jisus, ọ bu ezie na ọ mara nání baptism nke Jọn: 26 onye ahu we malite ikwuwa okwu n'ulo-nzukọ. Ma mb͕e Prisila na Akwila nuru okwu-ya, ha kutara ya n'ebe ha nọ, we kọrọ ya uzọ Chineke nke-ọma kari. 27 Mb͕e o zubere igabiga n'ofè ka ọ ba n'Akaia, umu-nna nime Kraist we me ka obi di ya ike, we degara ndi nēso uzọ Jisus akwukwọ inara ya nke-ọma: mb͕e o ruru, o yere ha aka nke-uku, bú ndi. kwereri site n'amara: 28 n'ihi na o ji ike kwukpa ndi-Ju ọnu nke-uku, n'iru ọra madu, ebe ọ nēgosi na Jisus bu Kraist-ha site n'ihe edeworo n'akwukwọ nsọ.

Ọlu Ndi-Ozi 19

1 O we rue mb͕e Apọlos nọ na Kọrint, na Pọl, mb͕e ọ gabigasiri nime elu ala, ọ biaruru Efesọs, hu madu ufọdu ndi nēso uzọ Jisus: 2 o we si ha, Ùnu natara Mọ Nsọ mb͕e unu kwere? Ha si ya, É-è, kama ayi anughi ọbuná ma enyere Mọ Nsọ. 3 O we si, Ọ̀ bu ibà nime gini kwa ka emere unu baptism? Ha we si, Ibà nime baptism nke Jọn. 4 Pọl we si, Jọn ji baptism nke nchèghari eme baptism, nāsi ndi-Ju ka ha kwere n'Onye ahu Nke gaje ibia n'azu ya, nke ahu bu, na Jisus. 5 Mb͕e ha nuru nka, ewe me ha baptism ibà n'aha Onye-nwe-ayi Jisus. 6 Mb͕e Pọl bikwasisiri ha aka-ya abua n'isi, Mọ Nsọ we biakwasi ha; ha we kwue okwu n'asusu di iche iche ọzọ, bu kwa amuma. 7 Ha nile ra ka ndikom iri na abua. 8 O we ba n'ulo-nzukọ-ha, we nēkwuwa okwu ogologo ọnwa atọ, nāgwa ha okwu n'ihe nile bayere ala-eze Chineke, nēme kwa ka ha kweye ha. 9 Ma mb͕e obi madu ufọdu mere etili, mb͕e ha ghara kwa ikweye, nēkwu ihe ọjọ bayere Uzọ Jisus n'iru ọra madu, o we si n'ebe ha nọ pua, kewapu ndi nēso ụzọ Jisus, nēkwu okwu kwa-ubọchi n'ulo-akwukwọ Tiranọs. 10 Ewe nēme nka ogologo arọ abua; ya mere ndi nile ndi bi n'Esia nuru okwu Onye-nwe-ayi, ma ndi-Ju ma ndi-Grik. 11 Chineke nālu kwa ọlu di ike site n'aka Pọl dika anāhughi mb͕e ọ bula: 12 ya mere anēsi n'aru-ya wetara ndi aru-ha nādighi ike ichafọ ma-ọbu ákwà apron, ọria-ha we la n'aru-ha, ajọ mọ nile aputa kwa. 13 Ma ufọdu nime ndi-Ju ndi nējeghari, bú ndi si na ha nāchupu ndi ajọ mọ, tiye-kwa-ra-aka-ha ikpọkwasi aha Onye-nwe-ayi Jisus n'isi ndi nwere ajọ mọ ahu, nāsi, Ewerem Jisus Onye Pọl nēkwusa b͕a unu iyi. 14 Umu-ndikom asa nke otù onye-Ju, anākpọ Skiva, bú onye-isi-nchu-àjà, di, ndi mere nka. 15 Ajọ mọ ahu we za, si ha, Jisus ka m'matara, ama-kwa-ram Pọl; ma ùnu onwe-unu bu ole ndi? 16 Nwoke ahu onye ajọ mọ di nime ya we wukwasi ha, karia ha abua, o nwe-kwa-ra ike n'aru-ha, ya mere ha si n'ulo ahu b͕apu, b͕ara ọtọ, emeru kwa ha aru. 17 Ewe me ka ndi nile ndi bi n'Efesọs, ma ndi-Ju ma ndi-Grik, mara nka; ha nile we tua egwu, eme-kwa-ra aha Onye-nwe-ayi Jisus ka ọ di uku. 18 Ọtutu madu n'etiti ndi kwereri na Jisus bia-kwa-ra, nēkwuputa, nākọ kwa ihe nile ha nēme. 19 Ọ dighi kwa madu ole-na-ole n'etiti ndi nēme mb͕asi kpokọtara akwukwọ-ha, rechapu ha ọku n'iru ọra madu: ha we gua ọnu-ahia-ha, we hu na ọ bu ọgu nnù ego ọla-ọcha isi na nnù ise. 20 Otú a ka okwu Onye-nwe-ayi were ike nāga n'iru n'iru nādi kwa irè. 21 Ma mb͕e ihe ndia mezuru, Pọl zubere na mọ-ya iga Jerusalem, mb͕e ọ gāgabigasi nime Masedọnia na Akaia, si, Mb͕e m'rusiri ebe ahu, aghaghm ihu kwa Rom. 22 Mb͕e o zigasiri na Masedọnia madu abua nime ndi nējere ya ozi, bú Timọti na Erastọs, ya onwe-ya we nọdu n'Esia nwa oge. 23 Ma ihe di ka oge ahu ọ bughi nkpasu ntà putara bayere Uzọ Jisus. 24 N'ihi na otù nwoke, aha-ya bu Dimitriọs, bú uzú ọla-ọcha, onye nākpu ulo nsọ ntà nke ọla-ọcha nke Daiana, ọ bughi ọlu ntà ka onye ahu nēwetara ndi-ọ̀kà; 25 ndi ọ kpọkọrọ, ha na ndi nālu ọlu di otú ahu, we si, Ndikom, unu mara na ayi nwere àkù-ayi site n'ọlu a. 26 Ma unu nāhu nānu kwa, na ọ bughi nání n'Efesọs kama ọ fọduru ihe ntà ka ọ buru n'Esia nile, ka Pọl nka rafuru oké ìgwè madu wepu kwa ha n'ezi uzọ, ebe ọ nāsi na ihe eji aka me abughi chi: 27 ọ bughi kwa nání na ihe-ize-ndu di na agēlelì ọlu-ayi nka; kama na agāgu kwa ulo nke oké chi-nwanyi ahu, bú Daiana, n'ihe-efu, na agaje kwa isi n'idi-uku-ya weda ya n'ala, onye Esia dum na elu-uwa dum madu bi nāsọpuru. 28 Mb͕e ha nuru nka, ha we juputa n'ọnuma, ti kwa nkpu, si, Daiana nke ndi Efesọs di uku. 29 Obodo ahu we juputa n'aghara ahu: ha we were otù obi nubà nime ebe anēkiri ihe, mb͕e ha jidesiri Gaiọs na Aristakọs, ndi Masedọnia, ndi nēso Pọl n'ije. 30 Ma mb͕e Pọl zubere ibakuru ọra madu ahu, ndi nēso uzọ Jisus ekweghi ya. 31 Ufọdu kwa n'etiti ndi-isi Esia, ebe ha bu ndi-eyì-ya, ha zigara ya ozi, we riọ ya ka ọ ghara inuye onwe-ya nime ebe ahu anēkiri ihe. 32 Ya mere ufọdu nēti nkpu otù ihe, ufọdu nēti kwa ihe ọzọ: n'ihi na nzukọ ahu nāb͕a aghara; ndi kariri n'ọnu-ọgugu n'etiti ha amataghi kwa ihe ha jiri zukọ. 33 Ha we si n'etiti ìgwè madu ahu nupu Aleksanda, ebe ndi-Ju nēnu ya ka o buru uzọ. Aleksanda we kpukpue ha aka, nāchọ ka ọ gọpuru ọra madu onwe-ya. 34 Ma mb͕e ha mazuru na ọ bu onye-Ju, ha nile were otù olu nēti nkpu ihe ra ka oge hour abua, si, Daiana nke ndi Efesọs di uku. 35 Ma mb͕e ode-akwukwọ-ha mesiri ka ìgwè madu ahu jurú, ọ si, Ndikom Efesọs, Ònye di n'etiti madu nke nāmaghi na obodo ndi Efesọs bu odozi-ulo-nsọ, oké Daiana ahu, na nke arusi nke si n'elu-igwe da? 36 Ya mere ebe anāpughi irughari ihe ndia uka, unu aghaghi ijurú, na ighara ime ihe nēchèghi echè. 37 N'ihi na unu kutara ndikom ndia n'ebe a, ndi nābughi ndi nēzu ihe ulo chi n'ori ma-ọbu ndi nēkwulu chi-nwanyi nke ayi. 38 Ya mere ọ buru na Dimitriọs, na ndi-ọ̀kà ndi soro ya, nwere okwu megide onye ọ bula, anēdebe ubọchi ikpé, ndi-isi nọ kwa: ka ha borita onwe-ha ebubo. 39 Ma ọ buru na unu nāchọ ihe ọ bula bayere okwu di iche, agēdozi ya na nzukọ ahu nke ziri ezi n'iwu. 40 N'ihi na ayi nọ n'ihe-ize-ndu na agēji ihe mere ta bo ayi ebubo na ayi biliri megide ndi-isi, ebe ọ nādighi ihe wetara ya: n'ihi ya ayi agaghi-apu kwa iza ajuju bayere nb͕akọ a. 41 Mb͕e o kwusiri okwu ndia, o we zilaga nzukọ ahu.

Ọlu Ndi-Ozi 20

1 Ma mb͕e ùzù ahu tubìri, mb͕e Pọl kpọtasiri ndi nēso uzọ Jisus, kasi kwa ha obi, o kele ha ekele ikpe-azu we pua iga ba na Masedọnia. 2 Mb͕e ọ gabigasiri n'akuku ahu nile, were kwa ọtutu okwu kasie ha obi, ọ bia na Gris. 3 Mb͕e ọ nọsiri ọnwa atọ n'ebe ahu, mb͕e ndi-Ju b͕a-kwa-ra ajọ ìzù megide ya, mb͕e ọ gaje inupu ub͕ọ ije Siria, o zubere isi uzọ Masedọnia laghachi. 4 Sopata, nwa Pirọs, onye Beria, we so ya; ya na Aristakọs na Sekundọs, nime ndi Tesalọnaika; na Gaiọs nke Dabe, na Timọti, na Tikikọs na Trọfimọs, bú ndi Esia. 5 Ma ndia bururi uzọ je, we nēche ayi na Troas. 6 Ayi onwe-ayi we si na Filipai ba n'ub͕ọ je, mb͕e ubọchi achicha ekoghi-eko gasiri, ayi we biakute ha na Troas ka o ruru ubọchi ise; ebe ayi nọgidere ubọchi asa. 7 N'ubọchi mbu n'ízù ubọchi asa, mb͕e ayi zukọrọ inyawa achicha, Pọl we gwa ha okwu, ebe ọ gaje ila echi-ya; o we kwugide okwu rue etiti abali. 8 Ọtutu ọku-ọwa di kwa n'ime-ulo nke di n'elu ulo, ebe ayi zukọrọ. 9 Ma otù okorọbia, aha-ya bu Yutikọs, nānọdu na window, onye oké ura nākwada; mb͕e Pọl nēkwu okwu rue oge dikari anya, ebe ura-ya kwadara ya o we si n'ulo elu nke-atọ di n'ulo ahu da n'ala, o mewo ozu mb͕e ha buliri ya. 10 Ma Pọl ridara, dakwasi ya, makua ya, si, Unu atula ùzù; n'ihi na ndu-ya di nime ya. 11 Mb͕e ọ rigosiri, nyawa achicha, ri kwa, mb͕e ya na ha kparitasi-kwa-ra ogologo oge, ọbuná rue chi-ọbubọ, o we pua otú a. 12 Ha we kuta nwa-okoro ahu na ndu, ọ bughi kwa nkasi-obi ntà akasiri ha. 13 Ma ayi onwe-ayi, ebe ayi buru uzọ je ub͕ọ, ayi nupuru ub͕ọ ahu ije Asọs, n'ihi na ayi zubere iwere Pọl n'ub͕ọ n'ebe ahu: n'ihi na otú a ka ọ karari, ebe o zubere na ya onwe-ya gāga n'ukwu-ala. 14 Mb͕e o zutere ayi n'Asọs, ayi were ya n'ub͕ọ, we bia rue Mitilini. 15 Ayi we si n'ebe ahu ga, we rue na ncherita-iru Kaiọs n'ubọchi soni; ubọchi so ya ayi we rue ala na Samọs, we chere oge ufọdu na Trogilium; ubọchi soni ayi we bia rue Militọs. 16 N'ihi na Pọl zubereri igabiga Efesọs n'ub͕ọ, ka aghara ime ya ka ọ nọgide ogologo oge n'Esia; n'ihi na ọ nēme ngwa iru Jerusalem mb͕e ubọchi Pentikọst akērughi, ma ọ buru na ọ puru ime ya. 17 O we si na Militọs ziga n'Efesọs, kpọ ndi-okenye nke nzukọ Kraist ka ha biakute ya. 18 Mb͕e ha biakutere ya, ọ si ha, Unu onwe-unu mara, site n'ubọchi mbu m'zọrọ ukwu n'Esia, otú m'nọ n'etiti unu oge ahu nile, 19 otú m'buru orù Onye-nwe-ayi n'obi di ume-ala nile, na anya-miri, na ọnwunwa di iche iche nke dakwasirim n'ajọ ìzù nile nke ndi-Ju: 20 otú egwu nēmeghm ka m'ghara ikọrọ unu otù ihe n'ihe nile bara unu urù, na izí unu ihe n'iru ọra madu, n'ulo nke aka unu kwa n'otù n'otù, 21 nāgwasi unu ike, ma ndi-Ju ma ndi-Grik, okwu nchèghari n'ebe Chineke nọ, na okwukwe n'ebe Onye-nwe-ayi Jisus nọ. 22 Ma ub͕u a, le, mu onwem nāga Jerusalem n'ab͕u nime mọ nkem, nāmataghi ihe ọ bula gābiakwasim n'ebe ahu: 23 ọ bu nání na Mọ Nsọ nāgwasim ike n'obodo nile n'otù n'otù, nāsi na ab͕u na nkpab͕u nādigide nēchem. 24 Ma akpọghm ndum ihe, dika ihe oké ọnu-ahia n'ebe mu onwem nọ, ka m'we b͕azue ọsọm, jezu kwa ozi nke m'natara n'aka Onye-nwe-ayi Jisus, ikwusi ozi ọma ahu ike, bú nke amara nke Chineke. 25 Ma ub͕u a, le, mu onwem matara na unu onwe-unu nile, ndi m'jeghariri n'etiti unu nēkwusa ala-eze Chineke, na unu agaghi-ahu irum ọzọ. 26 N'ihi ya agwasim unu ike ubọchi ta, na adim ọcha n'ebe ọbara madu nile di. 27 N'ihi na egwu emeghm ka m'ghara ikọrọ unu ìzù nile nke Chineke. 28 Nēzenu onwe-unu na ìgwè aturu ntà nile, nke Mọ Nsọ mere unu ndi nēlekota ya anya n'etiti ya, ka unu nāzù nzukọ Chineke dika aturu, nke O ji ọbara nke Ya onwe-ya zutara Onwe-ya. 29 Mu onwem matara na mb͕e m'lasiri agu jọb͕uru onwe-ha gābà n'etiti unu, ghara imere ìgwè aturu ebere; 30 ndikom gēsite kwa n'etiti unu onwe-unu bilie, nēkwu ihe di iche iche nēduhie madu uzọ, ka ha dọpu ndi nēso uzọ Jisus iso ha n'azu. 31 N'ihi ya nēchenu nche, ebe unu chetara na ogologo arọ atọ arapughm iwere anya-miri nādu madu nile n'otù n'otù ọdú abali na ehihie. 32 Ub͕u a ararakwam unu nye n'aka Chineke na aka okwu amara-Ya, nke puru iwuli unu elu dika ulo, na inye unu ihe-nketa ahu n'etiti ndi nile edoworo nsọ. 33 Agu ọla-ọcha ma-ọbu ọla-edo ma-ọbu uwe nke onye ọ bula agughm. 34 Unu onwe-unu mara na akam ndia nālutara mu onwem na ndi mu na ha nọ ihe nākpà mu na ha. 35 N'ihe nile egosirim unu, na unu aghaghi idọb͕u onwe-unu n'ọlu otú a, na iyere ndi nādighi ike aka, na icheta okwu Onye-nwe-ayi Jisus, na Ya onwe-ya siri, Ọ di ngọzi inye ihe kari inara ihe. 36 Mb͕e o kwusiri ihe ndia, o b͕ue ikperè n'ala, ya na ha nile kpere Chineke. 37 Ha nile we kwa ákwá nke-uku, dakwasi Pọl n'olu, sutu kwa ya ọnu, 38 ihe nēb͕u ha nb͕u kari ihe nile bu okwu nke o kwururi, na ha agaghi-ahu iru-ya ọzọ. Ha we dupu ya n'ije-ya rue mb͕e ọ batara n'ub͕ọ.

Ọlu Ndi-Ozi 21

1 Ma mb͕e o ruru na ayi dọpusiri onwe-ayi n'ebe ha nọ, nupu kwa ub͕ọ, ayi gara otù iru je Kos, ubọchi so ya ayi we rue Rodes, we si n'ebe ahu je rue Patara: 2 ebe ayi huru ub͕o nke nāgabiga ofè Finisia, ayi we ba nime ya, we nupu. 3 Mb͕e ayi hugasiri Saiprọs anya, rapu kwa ya n'aka-ekpe, ayi we ga Siria, we pua n'ub͕ọ na Taia: n'ihi na ebe ahu ka ub͕ọ gaje ikwapu ihe di ya. 4 Mb͕e ayi chọtasiri ndi nēso uzọ Jisus, ayi we nọgide n'ebe ahu ubọchi asa: ndi ahu we gwa Pọl site na Mọ Nsọ, ka ọ ghara izọbà ukwu na Jerusalem. 5 Ma mb͕e o ruru na ayi nọzuru ubọchi ahu, ayi pua ga ije; ha nile, ha na nwunye-ha, na umu-ha, we dupu ayi n'ije-ayi, rue azu obodo-ha: ayi we b͕ue ikperè n'ala n'ótú, kpere Chineke, 6 we kelerita ibe-ayi ekele ikpe-azu; ayi we ba n'ub͕ọ, ma ndi ahu laghachiri n'ulo-ha. 7 Mb͕e ayi onwe-ayi jedebesiri ije-ayi n'ub͕ọ site na Taia, ayi we rue Tọlemais; ayi we kele umu-nna nime Kraist, ayi na ha we nọgide otù ubọchi. 8 Echi-ya ayi we pua, je rue Sisaria: ayi we ba n'ulo Filip onye nēzisa ozi ọma, nke bu otù nime ndikom asa ahu, ayi na ya we nọgide. 9 Ma onye a nwere umu-nwanyi anọ, ndi nāmaghi nwoke, ndi nēbu amuma. 10 Mb͕e ayi nānọgide n'ebe ahu ọtutu ubọchi, otù onye-amuma, aha-ya bu Agabọs, we si na Judia ridata. 11 O we biakute ayi, chiri ihe-ọkiké Pọl, ke onwe-ya ukwú na aka, si, Okwu ndia ka Mọ Nsọ kwuru, si, Otú a ka ndi-Ju ndi nọ na Jerusalem gēke nwoke nwe ihe-ọkiké a, ha gārara kwa ya nye n'aka ndi mba ọzọ. 12 Mb͕e ayi nuru ihe ndia, ayi we riọ ya, ma ayi onwe-ayi ma ndi ebe ahu, ka ọ ghara irigoro Jerusalem. 13 Mb͕e ahu Pọl zara, si, Gini ka unu nēme, ebe unu nākwa ákwá nētiwa kwa obim? n'ihi na edoziwo mu onwem ọ bughi nání ka ewe kem ab͕u, kama inwu kwa ọnwu na Jerusalem n'ihi aha Onye-nwe-ayi Jisus. 14 Mb͕e ọ juru ikweye, ayi we kpuchie ọnu, si, Ka eme ihe Onye-nwe-ayi nāchọ. 15 Mb͕e ubọchi ndia gasiri, ayi we kwakọ ihe-ayi, rigoro Jerusalem. 16 Ufọdu nime ndi nēso uzọ Jisus si na Sisaria so kwa ayi je, nēkuru otù Neson onye Saiprọs, onye sitere na mbu nēso uzọ Jisus, onye ayi gānọ n'ulo-ya dika ndi-ọbìa. 17 Mb͕e ayi ruru Jerusalem, umu-nna-ayi nime Kraist we were ọṅù nara ayi nke-ọma. 18 N'ubọchi soni Pọl soro ayi bakuru Jemes; ndi-okenye nile nọ kwa n'ebe ahu. 19 Mb͕e ọ kelerisi ha, o we kọ akukọ ihe nile n'otù n'otù nke Chineke lururi n'etiti ndi mba ọzọ site n'ije-ozi-ya. 20 Mb͕e ha nuru ya, ha we nye Chineke otuto, ha we si ya, Nwa-nna-ayi, i huwo ka ha ra, bú ọtutu madu riri nne n'etiti ndi-Ju ndi kweworo na Jisus; obi ha nile nānu kwa ọku nye iwu-ayi: 21 eji-kwa-ra okwu-ọnu zí ha ihe bayere gi, na i nēzí ndi-Ju nile ndi nọ n'etiti ndi mba ọzọ irapu Moses, ebe i nāgwa ha ka ha ghara ibì umu-ha úgwù, ka ha ghara kwa ijeso ọme-n'ala nile nke iwu-ayi. 22 Ọ̀ bu gini kwa? ha aghaghi inu na i biawo. 23 Ya mere, me nka nke ayi nāsi gi: Ayi nwere ndikom anọ ndi nkwa ha kwere Chineke di n'isi-ha; 24 kuru ndia tiyere onwe-gi, me ka gi na ha di ọcha, kwu-kwa-ra ha ugwọ ihe ha ji chu àjà, ka ha we kọpu isi: madu nile gāmara kwa na ezi-okwu adighi n'ihe ejiwo okwu-ọnu zí ha bayere gi; kama na gi onwe-gi nāgazi kwa, nēdebe iwu-ayi. 25 Ma ayi onwe-ayi zìri akwukwọ-ozi bayere ndi mba ọzọ ndi kweworo, nēnye iwu ka ha debe onwe-ha ghara imetu ihe achuru n'àjà nye arusi aka, ha na ọbara, na anu anyab͕uru anyab͕u, na ikwa-iko. 26 Mb͕e ahu Pọl kuru ndikom ahu tiyere onwe-ya, n'ubọchi so ya o we me ka ya na ha di ọcha, we ba n'ulo uku Chineke, nēgosi nmezu ubọchi nile nke anēme ka ha di ọcha, rue mb͕e echere n'iru Chineke onyinye ahu n'ihi madu nile n'otù n'otù nime ha. 27 Ma mb͕e ubọchi asa ahu gaje izu, ndi-Ju ndi si n'Esia bia, mb͕e ha huru ya n'ulo uku Chineke, ha me ka ìgwè madu ahu nile b͕a aghara, ha we dakwasi ya aka, 28 nēti nkpu, si, Ndikom Israel, yere ayi aka: Nka bu nwoke ahu, onye nēzí madu nile n'ebe nile ihe megide ndi-Ju, na iwu-ayi, na ebe nka: tukwasi ya o dubata-kwa-ra ndi-Grik n'ulo uku Chineke, o meruwo kwa ebe nsọ a. 29 N'ihi na ha buri uzọ hu ya na Trọfimọs onye Efesọs n'obodo, onye ha nēchè na Pọl dubatarari n'ulo uku Chineke. 30 Obodo ahu dum we me uṅara, ndi-Ju we b͕akọta: ha we jide Pọl, dọkpupu ya n'ulo uku Chineke: ngwa ngwa ewe mechie ọnu-uzọ nile. 31 Mb͕e ha nāchọ uzọ ib͕u ya, akukọ we rigo rue nti onye-isi-ọchi-agha nke òtù ndi-agha, na Jerusalem dum nāb͕a aghara. 32 Ngwa ngwa o we chiri ndi-agha na ndi-ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, we b͕adakwasi ha: mb͕e ha huru onye-isi-ọchi-agha na ndi-agha, ha we rapu iti Pọl ihe. 33 Mb͕e ahu onye-isi-ọchi-agha biaruru nso, jide ya, si ka ewere nkpọrọ abua ke ya; ọ ju-kwa-ra onye ọ bu, na ihe o mereri. 34 Ufọdu nime ìgwè madu ahu we ti nkpu otù ihe, ndi ọzọ ti kwa ihe ọzọ: ma mb͕e ọ nāpughi imata okwu di itukwasi obi n'ihi ùzù ahu, ọ si ka ekuru ya ba n'ulo ndi-agha. 35 Mb͕e o ruru n'elu ihe eji arigo, o rue na ndi-agha buru ya n'ihi ihe-ike nke ìgwè madu ahu; 36 n'ihi na ọra ndi-Ju nēso n'azu, nēti nkpu, si, Wepu ya. 37 Mb͕e agaje ikubà Pọl nime ulo ndi- agha, ọ si onye-isi-ọchi-agha, Ì gēkwe ka m'gwa gi okwu? O we si, Ì mara asusu Grik? 38 Gì onwe-gi abughi kwa onye Ijipt ahu, onye mb͕e ubọchi ndia akērughi kpaliri nnù ndikom iri ahu n'etiti Ndi-ob͕u-madu, dupu kwa ha ba nime ọhia? 39 Ma Pọl siri, Mu onwem bu onye-Ju, nke Tasọs nime Silisia, onye amuru n'obodo amara aha-ya: ariọkwam i, kwe ka m'gwa ndi-Ju okwu. 40 Mb͕e o kwere ya, Pọl ka o guzoro n'elu ihe eji arigo, o we kpukpue ndi-Ju aka; mb͕e emere ka ha nile kpuchie nọ̄ ọnu nke-uku, o we gwa ha okwu n'asusu Hibru, si,

Ọlu Ndi-Ozi 22

1 Umu-nnem na ndi bu nnam, nurunu ngọpum n'ebe unu nọ ub͕u a. 2 Mb͕e ha nuru na ọ nāgwa ha okwu n'asusu Hibru, ha we kpuchie ọnu-kari: o we si, 3 Mu onwem bu onye-Ju, nke amuru na Tasọs nke Silisia, ma azùputaram n'obodo a, n'ukwu Gameliel, ezíwo mu ihe, dika esi edebezu iwu nke nna-ayi-hà, obim nānu ọku nye Chineke, dika unu onwe-unu nile di ta: 4 esob͕u-kwa-ram Uzọ a rue ọnwu, nēke ma ndikom ma ndinyom ab͕u nārara kwa ha nye n'ulo-nkpọrọ di iche iche. 5 Dika onye-isi-nchu-àjà nāb͕a-kwa-ram àmà, ya na nb͕akọ ndi-okenye nile: ndi m'nata-kwa-ra akwukwọ-ozi n'aka-ha inye umu-nne-ayi, m'we ga Damaskọs, idọkputa kwa ndi nọ n'ebe ahu n'ab͕u bia na Jerusalem, ka ewe me ka ha hu ahuhu-nmehie. 6 O we rue, mb͕e m'nāga, nābiaru kwa Damaskọs nso, n'oge di ka etiti-ehihie, na mberede oké ìhè si n'elu-igwe b͕urum àmùmà buruburu. 7 M'we da n'ala, nu otù olu ka ọ nāsim, Sọl, Sọl, gini mere i nēsob͕um? 8 Mu onwem we za, si, Ì bu onye, Onye-nwe-ayi? O we sim, Mu onwem bu Jisus Onye Nazaret, Onye gi onwe-gi nēsob͕u. 9 Ma ndi mu na ha nọ kiliri ìhè ahu n'ezie, ma ha anughi olu Onye ahu nāgwam okwu. 10 M'we si, Gini ka m'gēme, Onye-nwe-ayi? Onye-nwe-ayi we sim, Bilie, ga ba na Damaskọs; n'ebe ahu ka agāgwa kwa gi okwu bayere ihe nile nke akaworo gi ka i me. 11 Mb͕e m'nāhughi uzọ site ebube ìhè ahu, ndi mu na ha nọ we jidem n'aka durum, m'we ba na Damaskọs. 12 Otù onye, bú Ananaias, nwoke nke nātu egwu Chineke dika iwu-ayi si di, onye ndi-Ju nile bi n'ebe ahu b͕ara ezi àmà, 13 o we biakutem, guzo n'akukum, sim, Sọl, nwa-nnam, ka eme ka i hu uzọ. N'otù oge hour ahu ewe me ka mu onwem hu uzọ, m'we le ya anya. 14 O we si, Chineke nke nna-ayi-hà rọputara gi imara ihe Ọ nāchọ, na ihu Onye Ezi Omume ahu, na inu olu si n'ọnu-Ya puta. 15 N'ihi na i gāburu Ya onye-àmà n'ebe madu nile nọ nke ihe nile i huworo nu kwa. 16 Ub͕u a kwa gini mere i nāla azu? bilie, ka eme gi baptism, sachapu kwa nmehie-gi nile, nākpọku aha-Ya. 17 O we rue, mb͕e m'laghachisiri na Jerusalem, mb͕e m'nēkpe kwa ekpere n'ulo uku Chineke, na ihe di ka inyoghi biaram n'anya, 18 m'we hu Ya ka Ọ nāsim, Me ngwa, si na Jerusalem pua ọsọsọ: n'ihi na ha agaghi-anara àmà bayerem n'aka-gi. 19 Mu onwem we si, Onye-nwe-ayi, ha onwe-ha mara na mu onwem nātubà ndi kwere na Gi n'ulo-nkpọrọ, nēti kwa ha ihe n'ulo-nzukọ nile n'otù n'otù: 20 mb͕e anāwusi ọbara Stifen onye-àmà-Gi, mu onwem guzo-kwa-ra nso, o we dim ezi nma, anamedebe kwa uwe nke ndi nēb͕u ya. 21 O we sim, Ga ije-gi: n'ihi na Mu onwem gēsi n'ebe a zipu gi jekuru ndi mba ọzọ n'ebe di anya. 22 Ha nānu kwa olu-ya rue okwu a; ha we welie olu-ha elu, si, Wepu onye di otú a n'uwa: n'ihi na o kwesighi ka ọ di ndu. 23 Mb͕e ha nēti nkpu, nēyipu kwa uwe-ha, nēkpoli kwa àjà elu, 24 onye-isi-ọchi-agha we si ka ekuru ya bata n'ulo ndi-agha, ọ gwa ha ka ewere ipia-ihe chọputa isi okwu n'ọnu-ya, ka o we mazu ihe mere ha ji ti nkpu megide ya otú a. 25 Ma mb͕e ha chiri udọ̀-akpukpọ kesia ya, Pọl siri ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise nke guzoro n'ebe ahu, Ò ziri ezi n'iwu ka unu pia madu bu onye Rom ihe, nke bu kwa onye anāmaghi ikpé? 26 Ma mb͕e ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise nuru ya, ọ jekuru onye-isi-ọchi-agha, kọrọ ya, si, Gini ka i gaje ime? n'ihi na nwoke a bu onye Rom. 27 Onye-isi-ọchi-agha ahu we biakute ya, si ya, Gwam, gì onwe-gi bu onye Rom? Ọ si, E. 28 Onye-isi-ọchi-agha we za, si, Oké ego ka mu onwem ji zuta ọnọdu onye amuru n'obodo Rom. Pọl we si, Ma amuru mu onwem onye Rom. 29 Ya mere ndi gaje ichọputa isi okwu n'ọnu-ya si n'ebe ọ nọ pua ngwa ngwa: onye-isi-ọchi-agha we tu kwa egwu, mb͕e ọ matara na ọ bu onye Rom, na n'ihi na o kere ya-ri ab͕u. 30 Ma n'echi-ya, ebe o nēzube imara isi okwu, ihe mere ndi-Ju nēbo ya ebubo, ọ tọpuru ya, we gwa ndi-isi-nchu-àjà na nnọkọ-ikpé nile ka ha b͕akọ, ọ we kudata Pọl, guzo ya n'iru ha.

Ọlu Ndi-Ozi 23

1 Pọl we legide nnọkọ-ikpé ahu anya, si Umu-nnam, mu onwem ewerewo ezi akọ-na-uche nile biri n'iru Chineke dika onye-Ju rue ubọchi ta. 2 Onye-isi-nchu-àjà, bú Ananaias, we gwa ndi guzoro ya nso ka ha tie ya aka n'ọnu. 3 Mb͕e ahu Pọl siri ya, Chineke gaje iti gi aka, gi mb͕idi etere nzu: gì onwe-gi nānọdu kwa ala ikpem ikpé dika iwu-ayi si di, i we kwue ka etiem aka n'uzọ megidere iwu ahu? 4 Ndi guzoro nso we si, Ì nēkwutọ onye-isi-nchu-àjà nke Chineke? 5 Pọl we si, Amataghm, umu-nnem, na ọ bu onye-isi-nchu-àjà: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ekwula okwu ọjọ megide onye-isi ọ bula nke ndi nke gi. 6 Ma mb͕e Pọl matara na otù uzọ nime ha bu ndi-Sadusi, ma uzọ nke-ọzọ bu ndi-Farisi, o tiri nkpu nime nnọkọ-ikpe ahu, si, Umu-nnem, mu onwem bu onye-Farisi, nwa ndi-Farisi: anēkpe mu onwem ikpé bayere olile-anya na nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu. 7 Mb͕e o kwusiri okwu a, esem-okwu we puta n'etiti ndi-Farisi na ndi-Sadusi: ọra ndi ahu we kewa. 8 N'ihi na ndi-Sadusi nāsi na nbilite-n'ọnwu, ma-ọbu mọ-ozi, ma-ọbu mọ, adigh: ma ndi-Farisi nēkwuputa ha abua. 9 Oké iti-nkpu we puta: ufọdu n'etiti ndi-ode-akwukwọ ndi di n'akuku ndi-Farisi we guzo ọtọ, lu kwa ọ̀gù, si, Ayi ahughi ihe ọjọ n'aru nwoke a: ma gini kwa ma ọ buru na mọ ma-ọbu mọ-ozi gwara ya okwu? 10 Mb͕e oké esem-okwu putara, onye-isi-ọchi-agha, ebe ọ nātu egwu na ha gādọkasi Pọl ma eleghi anya, o we gwa ndi-agha ka ha rida napu ya n'ike n'etiti ha, kuta ya n'ulo ndi-agha. 11 Ma n'abali soni Onye-nwe-ayi guzoro n'akuku ya, si, Nwe obi-ike: n'ihi na dika i kwuru okwu bayerem si-ike na Jerusalem, i ghaghi ib͕a kwa àmà otú a na Rom. 12 Mb͕e chi-ya bọrọ, ndi-Ju ufọdu we kekọta onwe-ha n'otù, me kwa onwe-ha ka ha buru anathema, si na ha agaghi-eri ihe ma-ọbu iṅu ihe rue mb͕e ha gēb͕uwori Pọl. 13 Ndi ṅukọrọ iyi a kariri ọgu ndikom abua. 14 Ndi ahu we biakute ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye, si, Ayi ji anathema me onwe-ayi ka ayi buru anathema, na ayi agaghi-edetu ihe ọ bula ọnu rue mb͕e ayi gēb͕uwori Pọl. 15 Ya mere ub͕u a unu onwe-unu na nnọkọ-ikpé-ayi gosi onye-isi-ọchi-agha ka o kuda ya biakute unu, dika unu gaje itule ihe bayere ya nke-ọma kari: ma ayi onwe-ayi bu ndi edoziworo ib͕u ya mb͕e ọ kābiarughi unu nso. 16 Ma nwa nke nwa-nne-nwanyi Pọl nuru na ha nēche inwude ya, o we bia ba n'ulo ndi-agha ahu, kọrọ Pọl. 17 Pọl we kpọtara onwe-ya otù onye nime ndi-ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, si, Duru nwa-okorọbia nka jekuru onye-isi-ọchi-agha: n'ihi na o nwere ihe ikọrọ ya. 18 Ya mere o kuru ya, duru ya jekuru onye-isi-ọchi-agha, si, Pọl onye-nkpọrọ kpọrọm jekuru ya, we kperem ka m'dutara gi okorọbia nka, ebe ọ nwere okwu igwa gi. 19 Onye-isi-ọchi-agha we jide ya n'aka, wezuga onwe-ya we jua ya iche, si Gini bu ihe i nwere ikọrọm? 20 Ọ si, Ndi-Ju kwekọrọ ọnu ikpere gi ka i kuda Pọl echi jekuru nnọkọ-ikpé-ha, dika i gaje ijuta ihe bayere ya nke-ọma kari. 21 Ya mere, gi onwe-gi ekweyela ha: n'ihi na ndikom kariri ọgu madu abua n'etiti ha nēche inwude ya, ndi mere onwe-ha ka ha buru anathema, si na ha agaghi-eri ihe ma-ọbu iṅu ihe rue mb͕e ha gēb͕uwori ya: ub͕u a ha edoziwo kwa onwe-ha, nēche nkwa i gēkwe ha. 22 Ya mere onye-isi-ọchi-agha zilagara nwa-okorọbia ahu, nēnye ya iwu, si, Agwala onye ọ bula na i gosirim ihe ndia. 23 O we kpọtara onwe-ya madu abua nime ndi-ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, si, Dozienu ọgu ndi-agha iri ka ha ga rue Sisaria, na ọgu ndi-inyinya atọ na iri, na ọgu ndi-agha iri nāchi ube, n'oge hour nke-atọ n'abali: 24 ọ gwa-kwa-ra ha ka ha chita anu-ulo, ka ha we dọkwasi Pọl n'elu ha, debe kwa ya nke-ọma rue mb͕e ha gābiakute Filiks, bú onye-isi. 25 O we de akwukwọ-ozi nke yiri nka: 26 Klọdiọs Lisias nēdegara Filiks, bú onye-isi di oké ebube, akwukwọ, nēkele ya. 27 Ndi-Ju jidere nwoke a, ha gaje kwa ib͕u ya, mb͕e mu na ndi-agha biakwasiri ha, weputa ya n'aka-ha, ebe m'nutasiri na ọ bu onye Rom. 28 Ebe m'zubere imazu ihe mere ha ji bo ya ebubo, m'we kudata ya na nnọkọ-ikpé-ha: 29 onye m'huru na anēbo ya ebubo bayere ajuju di iche iche nke iwu-ha, ma o nweghi ihe eboro ya kwesiri ọnwu ma-ọbu ab͕u. 30 Ma mb͕e egosirim na agāb͕a ajọ ìzù megide nwoke a, ngwa ngwa m'we zitere gi ya, nye kwa ndi nēbo ya iwu ka ha kwugide ya okwu n'iru gi. 31 Ya mere ndi-agha, dika akara ha àkà, were Pọl, kuru ya rue Antipatris n'abali. 32 Ma n'echi-ya ha rapuru ndi-inyinya ka ha so ya je, ha we laghachi n'ulo ndi-agha: 33 mb͕e ndi ahu biaruru Sisaria, nye kwa onye-isi akwukwọ-ozi ahu, ha we che kwa Pọl n'iru ya. 34 Mb͕e ọ gusiri ya, ọ jua ajuju ala o si puta; mb͕e ọ jutara na ọ bu onye Silisia, 35 ọ si, M'gānuzu okwu-gi mb͕e ọ bula ndi boro gi ebubo gēru kwa ebe a: o we nye iwu ka edebe ya na Pritoriọm nke Herod.

Ọlu Ndi-Ozi 24

1 Mb͕e ubọchi ise gasiri onye-isi-nchu-àjà, bú Ananaias, we ridata, ya na ndi-okenye ufọdu, na otù onye-ọ̀kà-okwu, aha-ya bu Tatọlọs; ndi ahu we kọrọ onye-isi akukọ megide Pọl. 2 Mb͕e akpọrọ ya, Tatọlọs we malite ibo ya ebubo, si, Ebe ayi sitere n'aka-gi nwe udo ri nne, ebe esite-kwa-ra n'ezi uche, nke i ji buru uzọ zube ihe, nēmeziri mba nka ihe di iche iche, 3 ayi nānara ya nke-ọma n'uzọ nile na n'ebe nile, Filiks onye di oké ebube, ayi ji ekele nile. 4 Ma, ka m'ghara ime ka ike gwu gi kari, ariọm i ka i were obi-ọma-gi nuru okwu ole-na-ole n'ọnu-ayi. 5 N'ihi na ayi huru nwoke a ka ọ nābu onye nēme ka ihe ọjọ ba uba, onye nākpali kwa madu n'etiti ndi-Ju nile n'elu-uwa dum madu bi ka ha bilie megide ndi-isi, buru kwa otù onye-isi nime irọ-òtù ndi Nazaret: 6 onye nwa-kwa-ra imeru ulo uku Chineke: onye ayi jide-kwa-ra: 7 Ma onye-isi-ọchi-agha, bú Lisias, biakwasiri ayi, we were aka ike naputa ya n'aka-ayi; 8 onye i gāpu imazu n'ọnu-ya okwu bayere ihe nile ndia, nke ayi onwe-ayi nēbo ya ebubo, mb͕e gi onwe-gi gēkpe ya ikpé. 9 Ndi-Ju we so kwa ya n'ebubo ahu nāsi na ihe ndia di otú a. 10 Mb͕e onye-isi ahu fesiri ya aka ikwu okwu, Pọl we za, si, Ebe m'mara na i bu onye-ikpé nye mba nka ọtutu arọ gara aga, ewerem obi-utọ nāgọpu onwem: 11 ebe i puru imazu na ọ karighi ubọchi iri na abua site na mb͕e m'rigoro ikpọ isi ala nye Chineke na Jerusalem: 12 ha ahughm kwa ka m'nāgwa madu ọ bula okwu ma-ọbu ikpaliri ìgwè madu nime ulo uku Chineke, ma-ọbu nime ulo-nzukọ, ma-ọbu nime obodo. 13 Ha apughi kwa igosi gi ihe ha nēbom ebubo ub͕u a. 14 Ma nka ka m'kwuputara gi, na dika Uzọ ahu si di nke ha nākpọ irọ-òtù, ọ bu otú a ka m'nēkpere Chineke nke nna-ayi-hà, ebe m'kwere ihe nile nke di ka iwu-ayi si di, nke edewo-kwa-ra n'akwukwọ ndi-amuma: 15 n'ihi na enwerem olile-anya n'ebe Chineke nọ, nke ndia onwe-ha nēche kwa, na nbilite-n'ọnwu nke ndi ezi omume na nke ndi ajọ omume kwa gaje idi. 16 Nime nka ka m'nārughari kwa arum uka inwe akọ-na-uche nādighi-asu ngọngọ n'ebe Chineke na madu nọ mb͕e ọ bula. 17 Ma mb͕e ọtutu arọ gasiri abiarurum iluru mba nkem ọlu ebere, na iche onyinye di iche iche n'iru Chineke: 18 mb͕e m'nēme ihe ndia ha hurum n'ulo uku Chineke mb͕e m'mesiri onwem ka m'di ọcha, mu na ìgwè madu ma-ọbu itu-ùzù adigh: ma ndi-Ju ufọdu ndi si n'Esia bia 19 ndi aghaghi inọ n'ebe a n'iru gi, na ibom ebubo, ọ buru na ha nwere ihe ọ bula imegidem. 20 Ma-ọbu ka ndia onwe-ha kwue ajọ omume ọ bula ha huru, mb͕e m'guzoro n'iru nnọkọ-ikpé-ha, 21 ma-ọbughi n'ihi otù nkpu a, nke m'tiri mb͕e m'guzoro n'etiti ha, si, Ọ bu ikpé bayere nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu ka anēkpe mu onwem n'iru unu ta. 22 Ma ebe Filiks matara ihe bayere Uzọ Jisus nke-ọma kari, ọ gwa ha ka ha chere, si, Mb͕e ọ bula onye-isi-ọchi-agha, bú Lisias, gāridata, m'gātule okwu-unu. 23 O we nye ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise iwu ka edebe ya, ka eme kwa ka ihe diri ya nfé; ka aghara kwa ib͕ochi onye ọ bula nime ndi nke aka ya ijere ya ozi. 24 Ma mb͕e ubọchi ufọdu gasiri Filiks biaruru, ya na Drusila, nwunye nke aka ya, onye bu nwanyi Ju, o we kpọta Pọl, we nu okwu-ya bayere okwukwe nime Kraist Jisus. 25 Mb͕e ọ nēkwu okwu bayere ezi omume, na imerū ihe okè, na ikpé ahu nke gaje ibia, Filiks we tua egwu, o we za, si, Ga nke gi n'oge a; mb͕e m'nwere oge m'gākpọ kwa gi. 26 O nēle kwa anya na Pọl gēnye ya ego: n'ihi ya ọ nākpọta kwa ya ọtutu mb͕e, ya na ya nākparita kwa uka. 27 Ma mb͕e arọ abua b͕azuru, Pọsiọs Festọs nọchiri ọnọdu Filiks; ebe ọ nāchọ inwe iru-ọma n'ebe ndi-Ju nọ, Filiks we rapu Pọl n'ab͕u.

Ọlu Ndi-Ozi 25

1 Ya mere Festọs, mb͕e ala ahu batasiri n'aka-ya, mb͕e ubọchi atọ gasiri o si na Sisaria rigoro Jerusalem. 2 Ndi-isi-nchu-àjà na ndi-isi n'etiti ndi-Ju we kọrọ ya akukọ megide Pọl; ha riọkwa-ra ya, 3 nāchọ amara imegide ha, ka ọ kpọta ya na Jerusalem; ebe ha nēche anwu ib͕u ya n'uzọ. 4 Otú ọ di, Festọs zara, si na anēdebe Pọl na Sisaria, si kwa na ya onwe-ya gaje ilaghachi ọsọsọ. 5 Ọ si, Ya mere, ka ndi ji ike n'etiti unu som rida, ọ buru kwa na ọ di ihe ọ bula nwoke ahu mehiere, ka ha bo ya ebubo. 6 Mb͕e ọ nọsiri n'etiti ha ihe nākaghi ubọchi asatọ ma-ọbu ubọchi iri, ọ ridata na Sisaria; echi-ya o we nọdu n'oche-ikpé-ya, we si ka ekuta Pọl. 7 Mb͕e ọ biaruru, ndi-Ju ndi siworo na Jerusalem ridata we guzo ya buruburu, nēbo ya ọtutu ebubo di arọ́, nke ha nēnweghi ike igosi; 8 Pọl nāgọpu kwa onwe-ya, si, Emehieghm ma-ọli megide iwu ndi-Ju, ma-ọbu imegide ulo uku Chineke, ma-ọbu imegide Sisa. 9 Ma Festọs, ebe ọ nāchọ inwe iru-ọma n'ebe ndi-Ju nọ, ọ zara Pọl, si, Ì n'achọ irigoro Jerusalem, ka akpe gi ikpé banyere ihe ndia n'irum n'ebe ahu? 10 Ma Pọl siri, Anameguzo n'iru oche-ikpé nke Sisa, ebe aghaghi ikpem: emegideghm ndi-Ju ajọ omume ọ bula, dika gi onwe-gi mazu-kwa-ra nke-ọma. 11 Ya mere ọ buru na emem ajọ omume, ọ buru kwa na emewom ihe kwesiri ọnwu, ariọghm ib͕anari ọnwu: ma ọ buru na ọ dighi ihe bu ezi-okwu n'ebubo ndikom ndia nēbom, ọ dighi onye ọ bula puru iwerem nye ha n'amara. Ọ bu Sisa ka m'nākpọku. 12 Mb͕e ahu Festọs, mb͕e ya na nnọkọ-ikpé-ya b͕asiri ìzù, ọ zara, si, I kpọkuwo Sisa: ọ bu Sisa ka i gāgakuru. 13 Ma mb͕e ubọchi ufọdu gasiri, Agripa, bú eze, na Banaisi ruru Sisaria, kele kwa Festọs. 14 Mb͕e ha nānọgide n'ebe ahu ọtutu ubọchi, Festọs we debe okwu bayere Pọl n'iru eze ahu, si, Otù nwoke di onye Filiks rapuworo n'ulo-nkpọrọ: 15 mb͕e m'nọ na Jerusalem, ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye nke ndi-Ju we gwam okwu bayere ya, nāriọ ka ama ya ikpé. 16 M'we za ha, si, na ọ bughi ọme-n'ala nke ndi Rom iwere amara rara madu ọ bula nye, ma ọ buru na onye anēbo ebubo ebughi uzọ nwe ndi nēbo ya n'iru ya, hu kwa uzọ igọpu onwe-ya n'ihe eboro ya. 17 Ya mere mb͕e ha biakọrọ n'otù n'ebe a, alaghm azu, ma ubọchi so ya m'nọduru n'oche-ikpé, si ka ekuta nwoke ahu. 18 Ma mb͕e ndi nēbo ya ebubo guzoro ọtọ, ha ejighi ihe ọ bula nime ihe ọjọ mu onwem chère we bo ya; 19 ma ha ji ajuju ufọdu megide ya bayere nsọpuru-chi nke aka ha, na ajuju bayere otù Jisus, Onye nwururi anwu, Onye Pọl nāsi na Ọ di ndu. 20 Ebe mu onwem nwere obi abua otú m'gāju ajuju bayere ihe ndia, m'we jua ma ọ chọrọ iga Jerusalem, ka ekpe kwa ya ikpé bayere ihe ndia n'ebe ahu. 21 Ma mb͕e Pọl kpọrọ ka edebe ya nye ntule Ọgustọs, m'we si ka edebe ya rue mb͕e m'gēziga ya jekuru Sisa. 22 Agripa we si Festọs, Ọ gādim nma ka mu onwem nuru kwa nwoke ahu. Ọ si, Echi ka i gānu ya. 23 Ya mere echi-ya, mb͕e Agripa biara, ya na Banaisi, n'oké ebube, bata kwa n'ulo ọnunu-okwu, ha na ndi-isi-ọchi-agha, na ndikom amara aha-ha n'obodo ahu, mb͕e Festọs kwuru ewe kuta Pọl. 24 Festọs we si, Eze Agripa, na ndikom nile ayi na unu nọ n'ebe a, unu ahuwo onye a, onye ọra ndi-Ju nile riọrọm aririọ bayere ya, ma na Jerusalem ma n'ebe a, nēti nkpu na ọ di nkpà ka ọ ghara idi ndu ọzọ. 25 Ma mu onwem huru na o meghi ihe ọ bula kwesiri ọnwu: ma mb͕e ya onwe-ya kpọkuru Ọgustọs, m'we kpebìe iziga ya. 26 Ma enweghm okwu di itukwasi obi bayere ya idegara onye-nwem. N'ihi ya ekuputaram ya n'iru unu, ma nke ka n'iru gi onwe-gi, Eze Agripa, ka, mb͕e ekpesiri ya ikpé, ka m'we nwe ihe m'gēde n'akwukwo. 27 N'ihi na ọ dim ka ọ bu ihe uche nādighi ya, n'iziga onye-nkpọrọ, ka m'ghara igosi kwa ihe eboro ya.

Ọlu Ndi-Ozi 26

1 Agripa we si Pọl, Ekwere ka i kwuere onwe-gi okwu. Mb͕e ahu Pọl setiri aka-ya, we gọpu onwe-ya, si: 2 Eze Agripa, agurum onwem n'onye ngọzi diri, na agajem igọpu onwem n'iru gi ta n'ebubo nile ndi-Ju nēbom: 3 nke ka ebe i mazuru ọme-n'ala nile na ajuju nile di n'etiti ndi-Ju: n'ihi ya ariọm i ka i were ogologo-ntachi-obi nurum. 4 Ya mere, ndi-Ju nile matara ibi-obim site na nwata, nke sitere na mbu di n'etiti mba nke akam, na nime Jerusalem; 5 ebe ha buru uzọ maram site na mbu, ọ buru na ha chọrọ ib͕a àmà, na adim ndu ka onye-Farisi dika irọ-òtù ahu si di nke nēdebezu iwu kari n'uzọ ikpere Chineke ayi. 6 Eguzo-kwa-ram n'ebe a ub͕u a, ebe anēkpem ikpé bayere olile-anya nkwa ahu nke Chineke kwere nna-ayi-hà; 7 bú nkwa nke ebo-ayi iri na abua nēle anya na ha gēru, site n'ikpere Chineke si-ike abali na ehihie. Ọ bu kwa olile-anya nka ka ndi-Ju nēbom ebubo bayere ya, eze! 8 Gini mere anātule ya n'ihe anāgaghi-ekwe n'etiti unu, ma ọ buru na Chineke nēme ka ndi nwuru anwu si n'onwu bilie? 9 N'ezie mu onwem chère n'obim, na aghaghm ime ọtutu ihe megide aha Jisus onye Nazaret. 10 Nke m'me-kwa-ra na Jerusalem: mu onwem mechibido-kwa-ra ọtutu ndi nsọ n'ulo-nkpọrọ, ebe m'natara ike site n'aka ndi-isi-nchu-àjà, mb͕e eb͕uru ha m'we kweye imegide ha. 11 Esite-kwa-ram n'ime ka ha hu ahuhu-nmehie ọtutu mb͕e n'ulo-nzukọ nile chọ uzọ ime ka ha kwulu Chineke; ebe anya nādighm nma gabiga ókè megide ha, m'we nēsob͕u ha we rue obodo di iche eche di n'azu ala-ayi. 12 N'ime ihe ndia mb͕e m'nāga Damaskọs, ebe m'natara ike na nkweye n'aka ndi-isi-nchu-àjà, 13 n'etiti ehihie, eze, ahurum n'uzọ ìhè sitere n'elu-igwe, kariri onwunwu anyanwu, ka ọ nēnwu mu na ndi sorom n'ije buruburu. 14 Mb͕e ayi nile dasiri n'ala, m'we nu otù olu ka ọ nāsim n'asusu Hibru, Sọl; Sọl, gini mere i nēsob͕um? ọ di ike ka i b͕a ndudu eji achu ehi ukwu. 15 Mu onwem we si, Ì bu onye, Onye-nwe-ayi? Onye-nwe-ayi we si, Mu onwem bu Jisus, Onye gi onwe-gi nēsob͕u. 16 Ma bilie, guzo kwa n'ukwu-gi: n'ihi na emere ka i hum anya ka M'we me ihe a, irọputa gi ka i buru onye nēje ozi na onye-àmà nke ihe i hurum nime ha, na nke ihe M'gēme ka i hum anya nime ha; 17 nēweputa gi n'aka ndi-Ju, na n'aka ndi mba ọzọ, ndi Mu onwem nēziga gi jekuru ha, 18 isaghe anya-ha, ka ha we si n'ọchichiri chigharia ba n'ìhè, si kwa n'ike Setan chigharikute Chineke, ka ha we nara nb͕aghara nmehie nile na ihe-nketa n'etiti ndi edoworo nsọ site n'ikwere na Mu. 19 Site n'ihe ndia, eze Agripa, abughm onye nādighi-ekweye ọhù ahu nke elu-igwe: 20 kama eburum uzọ kọrọ ndi bi na Damaskọs akukọ, kọ kwa na Jerusalem, na nime ala Judia nile, kọ-kwa-ra ndi mba ọzọ, ka ha chègharia chigharikute kwa Chineke, nālu ọlu kwesiri nchèghari. 21 Ọ bu n'ihi ihe ndia ka ndi-Ju jiderem n'ulo uku Chineke, we nwa ib͕um. 22 Ya mere ebe m'natara iye-aka ahu nke si n'ebe Chineke nọ puta, eguzowom rue ubọchi ta, nāgwasi madu nile ike, ma onye uku, nēkwughi ihe ọ bula kari ihe ndi-amuma na Moses kwuru na ha gaje ime; 23 na Kraist-ayi aghaghi ihu ahuhu, na Ọ gaje kwa iburu uzọ kwusara ma ndi-Ju ma ndi mba ọzọ ìhè, site na nbilite-n' ọnwu nke ndi nwuru anwu. 24 Mb͕e ọ nāgọpu onwe-ya otú a, Festọs were oké olu si, Pọl, anya adighi gi nma; oké nmuta-akwukwọ-gi nēme gi ka i ghọ onye anya nādighi nma. 25 Ma Pọl siri, Abughm onye anya nādighi nma, Festọs onye di oké ebube; anamekwuwa okwu nke ezi-okwu na nke anya-udo. 26 N'ihi na eze mara ihe bayere ihe ndia, onye m'nāgwawa kwa okwu: n'ihi na emere ka m'kweye na ọ dighi ihe ọ bula n'ihe ndia ezonariri ya; n'ihi na emeghi ihe a na nkuku. 27 Eze Agripa, ì kwere ndi-amuma? amataram na i kwere. 28 Agripa we si Pọl, I nēji okwu ntà eme ka m'kweye ibu Kristian. 29 Pọl we si, Anamekpere Chineke ka, ma ọ bu n'iji okwu ntà ma-ọbu n'iji okwu uku, ọ bughi nání gi onwe-gi, kama ọ bu kwa ndi nile nānu olum ta, gāghọ aha madu mu onwem bu kwa, ma-ọbughi ab͕u ndia. 30 Eze we bilie, ya na onye-isi, na Banaisi, na ndi ha na ha nọduru: 31 mb͕e ha wezugasiri onwe-ha, we kwurita n'etiti onwe-ha, si; Nwoke a emeghi ihe ọ bula kwesiri ọnwu ma-ọbu ab͕u. 32 Agripa we si Festọs, Apuru irapu nwoke a ka ọ la, ma ọ buru na ọ kpọkughi Sisa.

Ọlu Ndi-Ozi 27

1 Mb͕e ekpebìri na ayi gābà n'ub͕ọ je Itali, ha we rara Pọl na ufọdu ndi-nkpọrọ ọzọ nye n'aka ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, aha-ya bu Juliọs, nke òtù ndi-agha Ọgustọs. 2 Ayi we ba n'ub͕ọ Adramitiọm, nke gaje iga ebe di n'usọ oké osimiri nke Esia, we nupu, Aristakọs, onye Masedọnia nke Tesalọnaika, soro kwa ayi. 3 Ubọchi soni ayi we rue ala na Saidon: Juliọs we were obi-ọma mezie Pọl, kwere ka o jekuru ndi-eyì-ya ka ewe le ya anya nke-ọma. 4 Ayi we si n'ebe ahu nupu ub͕ọ, we nāga ala Saiprọs nso, n'ihi na ifufe nēfegide ayi. 5 Mb͕e ayi gabigasiri oké osimiri nke di n'akuku Silisia na Pamfilia, ayi we rue Maira, obodo nke Lisia. 6 N'ebe ahu ka ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise huru ub͕ọ Aleksandria nke nēje Itali; o we me ka ayi ba nime ya. 7 Mb͕e ayi gasiri nwayọ ọtutu ubọchi, mb͕e ọ di kwa ayi ike iru na ncherita-iru Naidọs, ebe ifufe nēkweghi ka ayi ga n'iru ọzọ, ayi we nāga ala Krit nso, na ncherita-iru Salmoni; 8 o we di ayi ike iga n'akuku ya, ayi we rue otù ebe anākpọ Ọnu-miri Ọma; nke obodo Lasia di ya nso. 9 Ma mb͕e o ruru ọtutu oge, mb͕e ije-ub͕ọ di kwa egwu ub͕u a, n'ihi na ub͕u a ka oge Obubu-ọnu gasiri, Pọl we dọ ha aka na nti, 10 si ha, Ndikom, ahuwom na nbibi na oké iyì gaje idi n'ije-ub͕ọ a, ọ bughi nání nke ihe ub͕ọ nēbu na ub͕ọ onwe-ya, ma nke ndu-ayi kwa. 11 Ma ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise kweyere onye-isi ub͕ọ na onye nwe ub͕ọ, kari okwu Pọl kwuru. 12 Ebe ọnu-miri ahu nādighi n'ebe di nma inogide na mb͕e oyi, ndi ka n'ọnu-ọgugu nime ha we du ọdú ka enupu ub͕ọ n'ebe ahu, ma eleghi anya ha gēru Finiks, we nọgide n'ebe ahu na mb͕e oyi; nke bu otù ọnu-miri nke Krit, nke nēche iru n'Ọwuwa-anyanwu n'akuku Ugwu na akuku Ndida. 13 Mb͕e ifufe nēfe nwayọ, ebe ha chère na ihe ha nēzube eruwo ha aka, ha we pua nāga n'akuku Krit. 14 Ma mb͕e ogologo oge akāgaghi, oké ifufe jọb͕uru onwe-ya nke anākpọ Yurakwilo, we si n'ebe ahu fedata: 15 mb͕e ifufe ahu napuru ayi ub͕ọ, mb͕e ub͕ọ apughi kwa ichegide ifufe ahu, ayi we rapu aka, ewe nēfeghari ayi. 16 Ma ebe ayi b͕ara ọsọ rue agwe-etiti ntà nso anākpọ Klọda, ayi we nwe ike ijide ub͕ọ ntà ayi, ma ọ di ayi ike: 17 mb͕e ha dọlitesiri ya elu, ha we chiri udọ̀ ime ka ub͕ọ-ayi sie ike, nēkebiga ya n'okpuru: ebe ha nātu egwu na agātubà ha na Satis ma eleghi anya, ha we dọda ákwà-ifufe, ewe nēfeghari ha otú a. 18 Mb͕e ifufe nēfegidesi ayi ike, ubọchi soni ha we tufube ihe ub͕ọ nēbu; 19 n'ubọchi nke-atọ ha we were aka-ha kpofue ihe ub͕ọ. 20 Ma mb͕e ọ nādighi anyanwu ma-ọbu kpakpando nāmukwasi ayi ọtutu ubọchi, mb͕e ọ dighi kwa oké ifufe ntà nēfekwasi ayi, ewe wepu olile-anya nile na agāzọputa ayi site n'ub͕u a. 21 Mb͕e ha nọdusiri rue oge di anya nērighi ihe, mb͕e ahu Pọl we guzo n'etiti ha, si, Ndikom, o kwesiri ka unu kweyerem, ghara kwa inupu ub͕ọ na Krit, na inwe nbibi a na iyì a. 22 Ub͕u a adọkwam unu aka na nti ka unu nwere obi-utọ: n'ihi na ọ dighi ntufu gādi n'etiti unu, kama ọ bu ntufu nke ub͕ọ. 23 N'ihi na mọ-ozi nke Chineke ahu Onye nwem, Onye m'nēkpe-kwa-ra guzorom nso n'abali a, 24 si, Atula egwu, Pọl; i ghaghi iguzo n'iru Sisa: le kwa, Chineke ewerewo amara nye gi ndi nile gi na ha nānọ n'ub͕ọ. 25 N'ihi nka, ndikom, nwenu obi-utọ: n'ihi na ekwerem Chineke, na ọ gādi otú a ọbuná dika agwaworom. 26 Otú ọ di aghaghi itupu ayi n'elu otù agwe-etiti. 27 Ma mb͕e o ruru abali nke-iri-na-anọ, mb͕e ayi nērughari n'osimiri Adria, dika etiti abali ndi-ub͕ọ chère na ha nābiaru otù ala nso; 28 ha we tù oké osimiri, hu na ọ bu orú mbudu: mb͕e oge ntà gasiri, ha we tù ọzọ, hu mbudu iri na ise. 29 Ebe ha nātu egwu ma eleghi anya miri gātupu ayi n'ala nkume, ha we rada arilika anọ n'isi ub͕ọ, we kpe ekpere ka chi we bọ. 30 Mb͕e ndi-ub͕ọ nāchọ uzọ isi n'ub͕ọ b͕apu, mb͕e ha wedasi-kwa-ra ub͕ọ ntà n'oké osimiri, nēme dika ha gaje iseti arilika n'ọnu-ub͕ọ, 31 Pọl we si ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise na ndi-agha, Ọ buru na ndia anọgideghi n'ub͕ọ, apughi izọputa unu onwe-unu. 32 Mb͕e ahu ndi-agha bipuru udọ̀ ub͕ọ ntà ahu, we rapu ya ka ọ dapu. 33 Mb͕e chi gaje ibọ, Pọl we riọ ha nile ka ha rie nri, si Ta mere ya ubọchi nke-iri-na-anọ unu nēle anya, nọgide kwa n'ibū ọnu, ebe unu nērighi ihe. 34 N'ihi ya ariọm unu ka unu rie nri: n'ihi na nka diri nzọputa-unu: n'ihi na ọ dighi otù agiri-isi gēsi n'isi onye ọ bula n'etiti unu la n'iyì. 35 Mb͕e o kwusiri ihe ndia, nara kwa achicha, ọ kele Chineke n'iru madu nile: we nyawa ya, malite kwa iri ya. 36 Ha nile we nwe obi-utọ, ha onwe-ha we ri kwa nri. 37 Ayi nile ndi nọ n'ub͕ọ di ọgu madu iri-na-atọ na madu iri na isi. 38 Mb͕e ha rijusiri afọ, ha me ka ub͕ọ di nfé, site n'itufu ọka n'oké osimiri. 39 Ma mb͕e chi bọrọ, ha amataghi ala ahu: ma ha huru otù ọnu-miri nke nwere ótú, ha we b͕a ìzù ma ha puru ime ka miri nubà ub͕ọ n'ala. 40 Mb͕e ha tupusiri arilika nile, rapu kwa ha n'oké osimiri, ha we tọpu udọ̀ umara isi-ub͕ọ n'otù oge ahu; ha we dọlie ákwà-ifufe nke ọnu-ub͕ọ nye ifufe, we jebe n'ótú. 41 Ma ebe ha dabàra n'otù ebe di n'ab͕ata oké osimiri abua, ha we tiye ub͕ọ n'ala; ọnu-ub͕ọ we siri n'ala digide kwa nēnweghi ike ka eropu ya, ma ike ebili-miri nyajibere isi-ub͕ọ. 42 Ma ọdú ndi-agha duru bu ka ha b͕ue ndi-nkpọrọ, ka onye ọ bula nime ha ghara isi n'ub͕ọ gwu miri, we b͕alaga. 43 Ma ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise, ebe o nēzube izọputa Pọl, o b͕ochiri ha n'ìzù-ha; we si ka ndi puru igwu miri si n'ub͕ọ tubà onwe-ha na miri, buru uzọ rue ala: 44 ka ndi fọduru ru kwa, ufọdu n'elu ibo, ndi ọzọ n'elu ihe di iche iche si n'ub͕ọ puta. Otú a o we rue, na azọputara madu nile, ha we rue ala.

Ọlu Ndi-Ozi 28

1 Mb͕e azọputasiri ayi, mb͕e ahu ayi matara na anākpọ agwe-etiti ahu Melita. 2 Ndi bi n'ebe ahu, bú ndi nāsu asusu ọzọ, we were obi-ọma mezie ayi n'uzọ anāhughi mb͕e ọ bula: n'ihi na ha funwuru ọku, kpọbata ayi nile, n'ihi miri nke nēzo n'oge ahu, na n'ihi oyi. 3 Ma mb͕e Pọl chikọtasiri ùkwù nkù, tukwasi ha n'ọku, aju-ala we si n'okpom-ọku ahu puta, ta ya alu kokwasi kwa ya n'aka. 4 Mb͕e ndi ahu ndi nāsu asusu ọzọ huru anu-ọhia ahu ka o kokwasiri ya n'aka, ha we sirita ibe-ha, N'ezie nwoke a bu ob͕u-madu, onye ọ bu ezie na azọputara ya n'oké osimiri, ma Ikpé ziri ezi ekweghi ka ọ di ndu. 5 Otú ọ di, o febàra anu-ọhia ahu nime ọku, ma ọ dighi ihe ọjọ meruru ya aru. 6 Ma ha nēle anya na ọ gaje iza, ma-ọbu ida n'ala nwua na mberede: ma mb͕e ha nēle anya ogologo oge, ma ha ahughi ihe ọ bula jọrọ njọ mere ya, ha we chègharia uche-ha, si na ọ bu chi. 7 Ma n'ala di ab͕ata ebe ahu onye-isi agwe-etiti ahu, aha-ya bu Pọbliọs, nwere iberibe ala ufọdu; onye nara ayi nke-ọma, were kwa obi-ọma le ayi ọbìa ubọchi atọ. 8 O we rue, na nna Pọbliọs nēdina, aru-ọku na ọnyunyu-ọbara jidesiri ya ike: onye Pọl bakutere, we kpe ekpere, bikwasi ya aka abua me ka aru di ya ike. 9 Mb͕e emere nka, ndi fọduru n'agwe-etiti ahu ndi nāria nriaria we biakute ya, ewe me ka aru-ha di ike: 10 ha we were kwa ọtutu nsọpuru sọpuru ayi; mb͕e ayi nupuru ub͕ọ, ha we tiye n'ub͕ọ ihe nile di ayi nkpà. 11 Mb͕e ọnwa atọ gasiri ayi we ba n'ub͕ọ Aleksandria nupu, bú ub͕ọ nke nọgidereri n'agwe-etiti ahu na mb͕e oyi, nke ihe-iriba-ama-ya bu, Umu-nne-ndikom abua amuru n'otù mb͕e. 12 Ayi we rue ala na Sairakus, we nọgide n'ebe ahu ubọchi atọ. 13 Ayi we site n'ebe ahu ga buruburu, we rue Rijiọm: mb͕e otù ubọchi gasiri ifufe Ndida we febe, n'ubọchi nke-abua ayi we bia rue Pọtiọli: 14 ebe ayi huru umu-nna nime Kraist, ewe riọ ayi ka ayi na ha nọgide ubọchi asa: otú a ayi we bia rue Rom. 15 Umu-nna-ayi nime Kraist, mb͕e ha nuru ihe bayere ayi, ha we bia izute ayi rue Ahia Apiọs, na Ulo-ndi-ije Atọ: mb͕e Pọl huru ha, o kele Chineke, nwe kwa obi-ike. 16 Mb͕e ayi batara nime Rom, ewe kwe ka Pọl nọgide iche, ya na onye-agha nke nēche ya. 17 O rue, na mb͕e ubọchi atọ gasiri ọ kpọkọrọ ndi bu ndi-isi n'etiti ndi-Ju: mb͕e ha biakọrọ n'otù, ọ si ha, Umu-nnem, mu onwem, ọ bu ezie na emeghm ihe ọ bula megide ndi-Ju, ma-ọbu ọme-n'ala nke nna-ayi-hà, ma esi na Jerusalem raram nye n'aka ndi Rom ka m'buru onye-nkpọrọ: 18 ma ndi ahu, mb͕e ha kpesirim ikpé, ha zubere irapum ka m'la, n'ihi na ọ dighi ihe kwesiri onwu dim n'aru. 19 Ma mb͕e ndi-Ju kwugidere ya, erugiderem ka m'kpọkue Sisa; ọ bughi na enwerem ihe ibo mba nkem ebubo. 20 Ya mere n'ihi ihe nka ka m'riọrọ unu ka m'hu unu anya gwa kwa unu okwu: n'ihi na ọ bu n'ihi olile-anya nke Israel ka ekerem nkpọrọ a 21 Ha we si ya, Ayi onwe-ayi anataghi akwukwọ-ozi site na Judia bayere gi, ọ dighi kwa onye ọ bula n'etiti umu-nne-ayi ruru ebe a, we kọ akukọ ma-ọbu kwue ajọ ihe ọ bula bayere gi. 22 Ma ọ di ayi nma inu n'ọnu-gi ihe i tukwasiri uche-gi na ha: n'ihi na ihe bayere irọ-òtù a, ayi mazuru na anēkwugide ya ebe nile. 23 Mb͕e ha kasiri ya otù ubọchi àkà, ọtutu madu kariri we biakute ya n'ebe ọ nọ dika ọbìa; ndi ọ kọrọ akukọ, nēkwusi okwu ala-eze Chineke ike, nēme kwa ka ha kweye n'ihe bayere Jisus, site n'iwu Moses, site kwa na ndi-amuma, si n'ututu rue anyasi. 24 Ufọdu we kwere ihe nile ekwuru, ma ufọdu ekweghi. 25 Mb͕e ha nēnweghi otù olu n'etiti onwe-ha, ha we la, mb͕e Pọl kwusiri otù okwu, si, Mọ Nsọ we site n'ọnu Aisaia onye-amuma gwa nna-unu-hà okwu nke-ọma, 26 si, Jekuru ndi nka, si, N'ọnunu unu gānu, ma unu agaghi-anuta ma-ọli; N'ọhuhu unu gāhu, ma unu agaghi-ahuta ma-ọli: 27 N'ihi na obi ndi nka mara abuba, Nti-ha kpọchi-kwa-ra, Ha kpuchi-kwa-ra anya-ha; Ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ ma eleghi anya, Ghara kwa iwere nti-ha nu ihe, Ghara kwa iwere obi-ha ghọta, Ghara kwa ichighari, Ka M'ghara kwa ime ka aru di ha ike. 28 Ya mere maranu, na nzọputa nka, bú nke Chineke, ka ezigara ndi mba ọzọ: ndi ahu gānu kwa. 29 Mgbe o kwusiri okwu ndia, ndi-Ju we pua, rurita uka nke-uku n'etiti onwe-ha. 30 O we nọgide arọ abua dum n'ulo nke aka ya o goro ego, nānara kwa ndi nile bakutere ya, 31 nēkwusa ala-eze Chineke, nēwere kwa nkwuwa-okwu nile zí ihe nile bayere Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ọ dighi onye nēb͕ochi ya.

Rom 1

1 Pọl, orù nke Jisus Kraist, onye akpọrọ ibu onye-ozi, onye ekewapuru nye ozi ọma Chineke, 2 nke O buru uzọ kwere na nkwa site n'ọnu ndi-amuma-Ya n'ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ, 3 bayere Okpara-Ya, Onye amuru site na nkpuru Devid dika anu-aru si di, 4 Onye akaworo ibu Ọkpara Chineke n'ike, dika Mọ nke idi-nsọ si di, site na nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu; bú Jisus Kraist Onye-nwe-ayi, 5 Onye ayi sitere n'aka-Ya nata amara na ọlu onye-ozi, rue iṅa-nti nke okwukwe n'etiti mba nile, n'ihi aha-Ya: 6 ndi unu onwe-unu nọ kwa n'etiti ha, ndi akpọrọ ibu ndi nke Jisus Kraist: 7 Pọl nka nēdegara ndi nile nọ na Rom akwukwọ, bú ndi Chineke huru n'anya, ndi akpọrọ ibu ndi nsọ: Amara diri unu na udo nke si n'aka Chineke Nna-ayi na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist bia. 8 Mbu, anamekele Chinekem ekele site na Jisus Kraist bayere unu nile, na anēkwusa okwukwe-unu n'uwa dum. 9 N'ihi na Chineke, Onye m'nēkpere nime mọm n'ozi ọma nke Ọkpara-Ya, bu Onye-àmàm, otú m'nārapughi aka n'ihota unu, 10 nāriọ aririọ mb͕e nile n'ekperem nile, ọ buru na, ma eleghi anya, ub͕u a n'oge a ezi uzọ gādirim ibiakute unu, n'ihe Chineke nāchọ. 11 N'ihi na ihu unu anya nāgusim ike, ka m'kwe ka unu keta onyinye-amara ufọdu nke Mọ Nsọ, ka ewe me ka unu guzosie ike; 12 nke ahu bu, ka ewe kasie mu na unu obi n'etiti unu, site n'okwukwe ayi kwekọrọ, ma nke unu ma nke mu onwem. 13 Ma achọghi m ka unu ghara imara, umu-nnam, na ọtutu mb͕e m'zubere ibiakute unu (eb͕ochi-kwa-ram ibia rue ub͕u a), ka m'we nwe kwa nkpuru ufọdu n'etiti unu, dika ọ di kwa n'etiti ndi mba ọzọ fọduru. 14 Ejim madu nile ugwọ, ma ndi-Grik ma ndi nāsu asusu ọzọ, ma ndi mara ihe ma ndi nēnweghi uche. 15 Otú a, ka ihe bayere mu onwem ra, ọ dim ọku n'obi izì kwa unu ndi bi na Rom ozi ọma. 16 N'ihi na ihere ozi ọma ahu adighi-emem: n'ihi na ọ bu ike nke Chineke rue nzọputa nye onye ọ bula nke kwere; onye-Ju na mbu, na onye-Grik kwa. 17 N'ihi na anēkpughe ezi omume Chineke nime ya, site n'okwukwe rue okwukwe: dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ma onye ezi omume gēsite n'okwukwe di ndu. 18 N'ihi na esi n'elu-igwe kpughe iwe Chineke imegide asọpurughi-Chineke na ajọ omume nile nke madu, ndi nēb͕ochi ezi-okwu n'ajọ omume; 19 n'ihi na ihe apuru imata bayere Chineke nāputa ìhè nime ha; n'ihi na Chineke mere ka ọ putara ha ìhè. 20 N'ihi na ihe-Ya anya nāhughi site n'òkìkè uwa ka anāhu nke-ọma, ebe anāghọta ha site n'ihe nile ekère èkè, bú ike ebighi-ebi Ya na udi-Chineke-Ya; ka ha ghara inwe ngọpu: 21 n'ihi na, ọ bu ezie na ha mara Chineke, ma ha enyeghi Ya otuto dika Chineke, ha ekeleghi kwa Ya; kama emere ha ihe-efu n'ihe nile ha nātule n'obi-ha, obi-ha nke nēnweghi nghọta b͕a-kwa-ra ọchichiri. 22 Mb͕e ha nēkwu na ha bu ndi mara ihe, ha we ghọ ndi-nzuzu, 23 we were ebube nke Chineke anāpughi imebi b͕anwere oyiyi nke onyinyo madu apuru imebi, na nke anu-ufe na anu ukwu anọ na ihe nākpu akpu di iche iche. 24 N'ihi ya Chineke rara ha nye n'aka adighi-ọcha n'ihe ọjọ nile nāgu obi-ha, ka ewe me aru-ha ihe-ihere n'etiti ha: 25 ebe ha were ezi-okwu nke Chineke b͕anwere ugha-ha, ha we sọpuru nēkpe-kwa-ra ihe ekère èkè kama Onye kère èkè, Onye agọziworo ebighi-ebi. Amen. 26 N'ihi nka Chineke rara ha nye n'aka agu ihe-ihere: n'ihi na ndinyom-ha were nwanyi ha bu site n'ọmumu b͕anwere ihe nēmegide ka esi mu ha: 27 otú a ndikom rapu-kwa-ra otú anēme nwanyi site ka esi mu ya, we re ọku n'agu-ha n'aru ndikom-ibe-ha, ndikom nāluputa ihe nādighi nma n'anya n'aru ndikom, nānara kwa nime onwe-ha ugwọ-ọlu ahu nke njehie-ha nke ha nāghaghi inara. 28 Dika ha juru inọgide n'imazu Chineke, Chineke ra-kwa-ra ha nye n'aka uche ajuru aju, ime ihe ahu nile nēkwesighi; 29 ebe ha juputara n'ajọ omume nile, ajọ ọlu, anya-uku, obi ọjọ; juputa kwa n'ekworo, ob͕ub͕u-madu, esem-okwu, aghughọ, uche ọjọ; ndi-ntakwu, 30 ndi nēkwutọ madu, ndi nākpọ Chineke asì, ndi nēme madu ihe-ihere, ndi-npako, ndi nānya isi, ndi nāchọputa ihe ọjọ, ndi nēkweyeghi ndi muru ha, 31 Ndi nēnweghi nghọta, ndi nēmebi ọb͕ub͕a-ndu, ndi ihe madu-ibe-ha nādighi-atọ utọ, ndi nēnweghi obi-ebere: 32 madu ndi, ọ bu ezie na ha mazuru ihe Chineke guru n'ihe ziri ezi, na ndi nēme ihe di otú a kwesiri ọnwu, ma ọ bughi nání na ha nēme ha, kama ndi nēme ha di kwa ha ezi nma.

Rom 2

1 N'ihi ya i nweghi ngọpu, gi madu, onye ọ bula nēkpe ikpé: n'ihi na i nāma onwe-gi ikpe n'ihe i nēkpe madu-ibe-gi; n'ihi na gi onye nēkpe ikpe nēme otù ihe ahu. 2 Ayi ma-kwa-ra na ikpé Chineke di ka ezi-okwu si di imegide ndi nēme ihe di otú a. 3 Ma ì nāgu nka, gi madu, nke nēkpe ndi nēme ihe di otú a, ma i nēme kwa ha, na gi onwe-gi gāb͕anari ikpé Chineke? 4 Ma-ọbu ì nēlelì àkù nke obi-ọma-Ya na nke nnagide-Ya na nke ogologo-ntachi-obi-Ya, ebe i nāmaghi na ọlu obi-ọma Chineke nēdubà gi na nchèghari? 5 ma dika obi-etili-gi na obi-gi nēchègharighi si di i nākpado iwe nye onwe-gi n'ubọchi iwe na nkpughe nke ikpé ziri ezi nke Chineke; 6 Onye gēnyeghachi onye ọ bula dika ọlu-ya nile si di: 7 ndi site na ntachi-obi n'ezi ọlu nāchọ otuto na nsọpuru na apughi-imebi ka Ọ gēnye ndu ebighi-ebi: 8 ma ndi di n'akuku nke ikpa-iche-iche, ndi nēkweyeghi kwa ezi-okwu, kama ha nēkweye ajọ omume, iwe na ọnuma, 9 nkpab͕u na oké nkpà, gādiri ha, n'elu nkpuru-obi ọ bula nke madu onye nāluputa ihe ọjọ, nke onye-Ju na mbu, na nke onye-Grik kwa; 10 ma otuto na nsọpuru na udo gādiri onye ọ bula nke nālu ezi ọlu, onye-Ju na mbu, na onye-Grik kwa: 11 n'ihi na ile-madu-anya-n'iru adighi n'ebe Chineke nọ. 12 N'ihi na ka ha ra, bú ndi mehiere nēnweghi iwu, ha gāla kwa n'iyì nēnweghi iwu: ka ha ra kwa, bú ndi mehiere n'okpuru iwu, agēsite n'iwu kpe ha ikpé; 13 n'ihi na ọ bughi ndi nānu iwu bu ndi ezi omume n'ebe Chineke nọ, kama ọ bu ndi nēdebe iwu ka agāgu na ndi ezi omume: 14 n'ihi na mb͕e ọ bula ndi mba ọzọ ndi nēnweghi iwu nēme ihe nile di n'iwu site ka esi mu ha, ndi ahu, ọ bu ezie na ha enweghi iwu, ma ha onwe-ha bu iwu enyere onwe-ha; 15 n'ihi na ha nēgosi ọlu iwu na edewo ya n'obi-ha, akọ-na-uche-ha nēso kwa ya nāb͕a àmà, ihe ha nātule n'obi-ha n'etiti onwe-ha nēbo kwa ha ebubo ma-ọbu ma eleghi anya nāgọpu ha; 16 n'ubọchi ahu mb͕e Chineke gēkpe ihe-nzuzo nile nke madu nile, dika ozi ọma m si di, site n'aka Jisus Kraist. 17 Ma ọ buru na akpọrọ gi onwe-gi aha onye-Ju, ọ buru kwa na i nēzu ike n'elu iwu, nānya kwa isi na Chineke, 18 nāma kwa ihe Ọ nāchọ, nānwa kwa ihe ha na ibe-ha di iche, ebe anēwere okwu-ọnu zí gi ihe site n'iwu-gi, 19 ọ buru kwa na eme ka i kweye na gi onwe-gi bu onye-ndú nke ndi-ìsì, ìhè nke ndi nọ n'ọchichiri, 20 onye nāzùputa ndi nēnweghi uche, onye-ozizí nke umu ọhu, ebe i nēnwe udi nke ihe-ọmuma na nke ezi-okwu n'iwu ahu; 21 ya mere gi onye nēzí madu-ibe-gi ihe, ì dighi-ezí onwe-gi? gi onye nēkwusa ka madu ghara izu ori, ì nēzu ori? 22 gi onye nāsi ka madu ghara ikwa iko, ì nākwa iko? gi onye nākpọ arusi ihe-árú, ì nēzu ihe ulo chi ori? 23 gi onye nānya isi n'iwu, ì nēme Chineke ihe-ihere site na njehie-gi n'iwu ahu? 24 N'ihi na anēkwulu aha Chineke n'etiti ndi mba ọzọ n'ihi unu, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ. 25 N'ihi na obibì-úgwù nāba urù ezie, ma ọ buru na i nēdebe iwu: ma ọ buru na i bu onye-njehie n'iwu, obibì-úgwù-gi aghọwo ebìghi-úgwù. 26 Ya mere ọ buru na onye ebìghi-úgwù nēdebe ihe nile iwu-gi guru n'ihe ziri ezi, àgaghi-agu ebìghi-úgwù-ya n'obibì-úgwù? 27 onye ebìghi-úgwù ka esi mu ya, ma ọ buru na ọ debezu iwu, ọ̀ gaghi-ekpe kwa gi ikpé, onye sitere n'ihe edeworo n'akwukwọ na obibì-úgwù bu onye-njehie n'iwu? 28 N'ihi na onye nke bu onye-Ju n'anya madu abughi onye-Ju; obibì-úgwù ahu nke madu nāhu anya, nke di n'anu-aru, abughi kwa obibì-úgwù: 29 kama onye nke bu onye-Ju n'ihe zoro ezo, onye ahu bu onye-Ju; obibì-úgwù bu kwa nke nkpuru-obi, nime mọ, ọ bughi n'ihe edeworo n'akwukwọ; nke otuto-ya nēsiteghi n'aka madu, kama o sitere n'aka Chineke.

Rom 3

1 Gini kwa ka onye-Ju nwebigara ókè? ma-ọbu ùrù gini ka ibì-úgwù bara? 2 Ọ bara urù ri nne n'uzọ nile: mbu, na ewere okwu si n'ọnu Chineke puta nye ha n'aka na ntukwasi-obi. 3 N'ihi na asi na ufọdu ekweghi, gini kwa? èkweghi-ekwe-ha gēme ka ikwesi-ntukwasi-obi nke Chineke ghara idi irè? 4 Chineke ekwela: kama ka ọ puta ihè na Chineke bu Onye ezi-okwu, ma madu nile n'otù n'otù bu ndi-ugha; dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ka ewe gua Gi n'onye ezi omume n'okwu-Gi nile, Ka I we kpeb͕u kwa mb͕e anēkpe Gi ikpé. 5 Ma ọ buru na ajọ omume-ayi eme ka ezi omume Chineke puta ìhè, gini ka ayi gēkwu? Chineke, Onye nēme ka iwe-Ya dakwasi ayi, Ọ̀ bu onye ajọ omume? (Anamekwu dika madu. ) 6 Chineke ekwela: n'ihi na Chineke gēsi kwa aṅa kpe uwa ikpé? 7 Ma ọ buru na ezi-okwu nke Chineke babigara uba ókè n'iwetara Ya ebube site n'okwu-ugha nkem, gini mere anēkpe kwa mu onwem ikpé ọzọ dika onye-nmehie? 8 gini me-kwa-ra ayi asighi, Ka ayi me ihe ọjọ, ka ezi ihe we puta? (dika anēkwulu ayi, dika ufọdu nēkwu kwa na ayi nāsi), ndi ikpé-ha ziri ezi. 9 Gini kwa? àyi ka ha nma? É-è, ayi akaghi ha nma ma-ọli: n'ihi na ayi buru uzọ bo ndi-Ju bo kwa ndi-Grik ebubo, na ha nile nọ n'okpuru nmehie; 10 dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ọ dighi onye bu onye ezi omume, ọ dighi otù onye ma-ọli; 11 Ọ dighi onye nāghọta, Ọ dighi onye nāchọ Chineke; 12 Ha nile ewezugawo onwe-ha, ha nile abaghi n'ihe n'otù; Ọ dighi onye nēme ihe ọma, ọ dighi ọbuná otù onye: 13 Ílì ghere oghe ka akpiri-ha bu; Ha jiri ire-ha ghọ aghughọ: Edide aju-ala di n'okpuru eb͕ub͕ere-ọnu-ha: 14 Ndi ọnu-ha juru n'ọb͕ub͕a-iyi na ihe-ilu: 15 Ukwu-ha di ngwa iwusì ọbara; 16 Nbibi na ihuju-anya di n'uzọ nile ha; 17 Uzọ udo ka ha nāmaghi kwa: 18 Egwù Chineke adighi n'anya-ha. 19 Ma ayi matara na ka ha ra, bú ihe iwu Chineke nēkwu, ọ nāgwa ndi nọ n'okpuru iwu ahu; ka ewe kpuchita ọnu nile n'otù n'otù, ka ewe kwe na ikpé mara uwa nile n'ebe Chineke nọ: 20 n'ihi na site n'ọlu nile nke iwu ọ dighi madu ọ bula agāgu n'onye ezi omume n'iru Ya: n'ihi na ọ bu n'aka iwu ka nmazu nke nmehie sitere. 21 Ma ub͕u a emewo ka ezi omume Chineke puta ìhè nke nēguzo iche n'ebe iwu di, nke iwu ahu na ndi-amuma nāb͕ara ya àmà; 22 ma ọ bu ezi omume Chineke, site n'okwukwe ekwere na Jisus Kraist, nke diri ndi nile kwere: n'ihi na ọ dighi ihe di iche; 23 n'ihi na madu nile emehiewo, ha adighi-eru kwa otuto Chineke; 24 anēwere kwa amara-Ya nāgu ha na ndi ezi omume n'onyinye efu site na nb͕aputa ahu nke di nime Kraist Jisus: 25 Onye Chineke chere n'iru ọra madu ka Ọ buru ihe ijuru Ya obi, site n'okwukwe ekwere n'ọbara-Ya, igosi ezi omume-Ya, n'ihi nb͕aghara nmehie nile emehiereri n'oge gara aga, n'oge nnagide nke Chineke; 26 ka O we gosi ezi omume-Ya n'oge di ub͕u a, ka m'kwuru: ka Ya onwe-ya we buru onye ezi omume, buru kwa onye nāgu onye ahu n'onye ezi omume, bú onye nọ n'okwukwe ekwere na Jisus. 27 Òle ebe inya-isi-ayi di kwa? Emechibidowo ya n'èzi. Sìte n'aha iwu gini? ọ̀ bu nke ọlu? É-è: kama ọ bu site n'iwu nke okwukwe. 28 Ya mere ayi guru na anāgu madu n'onye ezi omume site n'okwukwe, mb͕e ọ kālughi ọlu iwu. 29 Ma-ọbu Chineke, Ọ̀ bu Chineke nke nání ndi-Ju? Ọ̀ bughi kwa Chineke nke ndi mba ọzọ? E, ọ bu kwa nke ndi mba ọzọ: 30 asi na ọ bu ezie na Chineke bu otù, Onye gāgu ndi obibì-úgwù na ndi ezi omume site n'okwukwe, were kwa okwukwe ahu gua ndi ebìghi-úgwù na ndi ezi omume. 31 Àyi nēsite kwa n'okwukwe-ayi me ka iwu ghara idi irè? Chineke ekwela: kama ayi nēme ka iwu guzo.

Rom 4

1 Gini kwa ka ayi gēkwu na Abraham huworo, bú nna-ayi ochie dika anu-aru si di? 2 N'ihi na asi na aguru Abraham n'onye ezi omume site n'ọlu, o nwere ihe inya isi; ma ọ bughi n'ebe Chineke nọ. 3 N'ihi na ọ̀ bu gini ka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nēkwu? Abraham we kwere Chineke, ewe gua nke ahu nye ya dika ezi omume. 4 Ma onye nālu ọlu, agughi ugwọ-ọlu-ya nye ya dika amara, kama dika ugwọ. 5 Ma onye nālughi ọlu, kama ọ kwere n'Onye ahu Nke nāgu onye nāsọpughi Chineke n'onye ezi omume, anāgu okwukwe-ya nye ya dika ezi omume. 6 Ọbuná dika Devid nāsi kwa na madu ahu bu onye ngọzi diri, bú onye Chineke nāgu ezi omume nye ya mb͕e ọ kālughi ọlu, 7 si, Ngọzi nādiri ndi ab͕aghara nmebì-iwu nile ha, Ndi ekpuchi-kwa-ra nmehie nile ha. 8 Ngọzi nādiri nwoke ahu onye Onye-nwe-ayi nāgaghi-agu nmehie nye ya. 9 Ọ̀ bu kwa ndi obibì-úgwù ka anākpọ ndi ngọzi a diri, ma-ọbu kwa ndi ebìghi-úgwù? n'ihi na ayi nāsi, Aguru okwukwe Abraham nye ya dika ezi omume. 10 Èsi kwa aṅa gu ya? àguru ya nye ya mb͕e ọ nọ n'obibì-úgwù, ma-ọbu mb͕e ọ nọ n'ebìghi-úgwù? Ọ bughi n'obibì-úgwù, kama ọ bu n'ebìghi-úgwù: 11 ọ we nara ihe-iriba-ama nke bu obibì-úgwù, bú akàrà nke ezi omume nke okwukwe ahu nke di n'ebìghi-úgwù-ya: ka o we buru nna nke ndi nile kwere, ọ bu ezie na ha nọ n'ebìghi-úgwù, ka ewe gua ezi omume nye ha; 12 ka o we buru kwa nna nke obibì-úgwù n'ebe ndi ahu nọ, bú ndi nābughi nání ndi sitere n'obibì-úgwù, kama ha nēsozi kwa ije-ukwu nke okwukwe ahu nke nna-ayi Abraham, nke o nwere n'ebìghi-úgwù. 13 N'ihi na esiteghi n'iwu kwere Abraham ma-ọbu nkpuru-ya nkwa, na ọ gābu onye-nketa nke uwa, kama o sitere n'ezi omume nke okwukwe. 14 N'ihi na asi na ndi ahu ndi sitere n'iwu bu ndi-nketa, emewo okwukwe ka ọ buru ihe-efu, me kwa nkwa ahu ka ọ ghara idi irè: 15 n'ihi na iwu ahu nāluta iwe; ma ebe iwu nādighi, njehie adighi kwa. 16 N'ihi nka o sitere n'okwukwe, ka o we di ka amara si di; ka nkwa ahu we guzosie ike n'ebe nkpuru ahu nile nọ; ọ bughi nání ndi sitere n'iwu ahu, kama ọ bu kwa ndi sitere n'okwukwe Abraham, onye bu nna nke ayi nile. 17 (dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Nna nke ọtutu mba ka M'meworo gi, ) n'iru Onye o kwere, bú Chineke, Onye nēme ndi nwuru anwu ka ha di ndu, Onye nākpọ kwa ihe nādighi, dika asi na ha di. 18 Onye kwere mb͕e ọ gasiri oge olile-anya, ebe ọ dabere n'olile-anya, ka o we ghọ nna ọtutu mba, dika ihe ekwururi si di, Otú a ka nkpuru-gi gādi. 19 O we tugharia uche n'aru nke onwe-ya nke nwuwori, (ebe ọ b͕ara ihe di ka ọgu arọ ise), tughari kwa uche n'àkpà-nwa Sera na ọ bu ihe nwuru anwu, ma emeghi ya ka ọ ghara idi ike n'okwukwe-ya: 20 o jighi kwa ekweghi-ekwe nwe obi abua n'ebe nkwa Chineke di, kama ejiri okwukwe-ya me ka o nwe ike, ọ nēnye kwa Chineke otuto, 21 nēkwezu kwa na ihe O kwereri na nkwa, Ọ puru ime kwa. 22 N'ihi ya agu-kwa-ra ya nye ya dika ezi omume. 23 Ma ọ bughi n'ihi nání ya ka edeworo ya n'akwukwọ nsọ, na aguru ya nye ya; 24 kama ọ bu kwa n'ihi ayi, ndi agaje igu ya nye ayi, ndi kwere n'Onye ahu Nke mere ka Jisus Onye-nwe-ayi si na ndi nwuru anwu bilie, 25 Onye arara Ya nye n'ihi ndahie-ayi nile, ewe me ka O si n'ọnwu bilie n'ihi igu ayi na ndi ezi omume.

Rom 5

1 Ya mere ebe aguru ayi na ndi ezi omume site n'okwukwe, ayi na Chineke di n'udo site n'aka Onye-nwe-ayi Jisus Kraist; 2 Onye ayi sitewo-kwa-ra n'aka-Ya nwe nkpọbata-ayi n'okwukwe-ayi nime amara nka ayi nēguzo nime ya; ayi nānya kwa isi, nādabere n'olile-anya nke otuto Chineke. 3 Ma ọ bughi nání nka, kama ayi nānya kwa isi nime nkpab͕u-ayi nile: ebe ayi matara na nkpab͕u nāluta ntachi-obi; 4 ntachi-obi ahu nāluta kwa ọnwunwa; ọnwunwa ahu nāluta kwa olile-anya: 5 Olile-anya ahu emeghi kwa ka ihere me ayi; n'ihi na awusaworo ihu-n'anya nke Chineke n'obi-ayi site n'aka Mọ Nsọ Nke enyere ayi. 6 N'ihi na mb͕e ayi nọ nādighi ike, mb͕e oge-Ya ruru Kraist nwuru n'ihi ndi nādighi-asọpuru Chineke. 7 N'ihi na ọ di ike na otù onye gānwu n'ihi onye ezi omume: n'ihi na ma eleghi anya otù onye gēnwe anya-ike ọbuná inwu n'ihi ezi madu. 8 Ma Chineke nēme ka ihu-n'anya nke aka Ya n'ebe ayi nọ puta ìhè, n'ihi na, mb͕e ayi nọ nābu ndi-nmehie, Kraist nwuru n'ihi ayi. 9 Ya mere nke kariri ri nne, ebe agusiri ayi na ndi ezi omume ub͕u a nime ọbara-Ya, agāzọputa ayi n'iwe Chineke site n'aka-Ya. 10 N'ihi na asi na, mb͕e ayi bu ndi-iro, esitere n'ọnwu Ọkpara-Ya me ka ayi na Chineke di n'otù: nke kariri ri nne bu, ebe emesiri ka ayi na Chineke di n'otù, na agāzọputa ayi nime ndu-Ya; 11 ma ọ bughi nání nka, kama ayi nānya kwa isi na Chineke site n'aka Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, Onye ayi siworo n'aka-Ya nata ime-ka-adi-n'otù a ub͕u a. 12 N'ihi nka, dika nmehie si n'aka otú madu ba n'uwa, dika ọnwu si n'aka nmehie ba kwa; ọnwu we si otú a gabiga rue madu nile, n'ihi na madu nile mehiere: 13 n'ihi na rue mb͕e iwu biara nmehie di n'uwa: ma adighi-agu nmehie mb͕e iwu nādighi. 14 Otú ọ di, ọnwu si n'oge Adam buru eze rue oge Moses, ọbuná ichiri ndi nēmehieghi n'oyiyi nke njehie Adam, onye bu ihe-atù nke Onye ahu gaje ibia. 15 Ma dika ndahie ahu si di, ọ bughi otú a ka onyinye-amara si di kwa. N'ihi na asi na ọra madu nwuru site na ndahie nke otù onye ahu, amara Chineke, na onyinye ahu nke di nime amara nke otù Madu ahu, Jisus Kraist, babigara ókè kari ri nne rue ọra madu. 16 Onyinye ahu abughi kwa dika o sitere n'aka otù onye nke mehiere: n'ihi na ikpé sitere n'otù onye bia weta amam-ikpe, ma onyinye-amara ahu sitere n'ọtutu ndahie bia weta ọlu igu madu na ndi ezi omume. 17 N'ihi na asi na ọnwu si n'aka otù onye ahu buru eze, site na ndahie nke otù onye ahu; ndi nānata nbabiga-ókè nke amara ahu na nke onyinye ahu, bú ezi omume, gābu kari eze ri nne na ndu site n'aka otù Onye ahu, bú Jisus Kraist. 18 Ya mere otú a, dika ikpé ahu sitere n'otù ndahie bia rue madu nile iwetara ha amam-ikpe; ọbuná otú a ka onyinye-amara ahu sitere n'otù ọlu ezi omume bia rue madu nile igu ha na ndi ezi omume ka ha nata ndu. 19 N'ihi na dika edoro ọra madu na ndi-nmehie site n'aṅaghi-nti nke otù madu ahu, ọbuná otú a ka agēdo ọra madu na ndi ezi omume site n'iṅa-nti nke otù Onye ahu. 20 Iwu we b͕ebà, ka ndahie ahu we rie nne; ma n'ebe nmehie riri nne, n'ebe ahu ka amara babigara ókè nke-uku kari: 21 ma, dika nmehie si buru eze n'onwu, ka amara we buru kwa eze otú a site n'ezi omume rue ndu ebighi-ebi site n'aka Jisus Kraist Onye-nwe-ayi.

Rom 6

1 Gini ka ayi gēkwu kwa? Àyi gānọgide na nmehie, ka amara we rie nne? 2 Chineke ekwela. Ayi onwe-ayi, bú ndi nwuru n'ebe nmehie di, àyi gēsi aṅa nādi ndu ọzọ nime ya? 3 Ma-ọbu ùnu amaghi na ka ayi-ra, bú ndi emere baptism iba nime Kraist Jisus, emere ayi baptism ibà n'ọnwu-Ya? 4 Ya mere esitere na baptism-ayi likọ ayi na Ya ibà n'ọnwu ahu: ka, dika esitere n'ebube nke Nna-Ya me ka Kraist si na ndi nwuru anwu bilie, ka ayi onwe-ayi we jeghari kwa na ndu ọhu otú a. 5 N'ihi na asi na ejiri oyiyi ọnwu-Ya me ka ayi na Ya tokọ buru otù ihe, agēji kwa oyiyi nke nbilite-n'ọnwu-Ya me ka ayi na Ya tokọ buru otù ihe; 6 ebe ayi mara nka, na akpọgidekọrọ Ya na madu ochie ayi n'obe, ka ewe me ka aru-ayi nke nmehie nwezu ghara idi irè, ka ayi we ghara idi nābu orù nke nmehie ọzọ; 7 n'ihi na onye nwuru anwu, aguwo ya o'nye ezi omume pua na nmehie-ya. 8 Ma ọ buru na ayi na Kraist nwukọrọ, ayi kwere na ayi na Ya gādikọ kwa ndu ọzọ; 9 n'ihi na ayi matara na ebe emere ka Kraist si na ndi nwuru anwu bilie Ọ gaghi-anwu ọzọ; ọnwu abughi kwa onye nēnwe Ya ọzọ. 10 N'ihi na ọnwu Ọ nwuru, Ọ nwuru nání otù ọnwu n'ebe nmehie di: ma ndu Ọ nādi, Ọ nādi n'ebe Chineke nọ. 11 Otú a unu onwe-unu, nāgu-kwa-nu na unu onwe-unu bu ndi nwuru anwu n'ebe nmehie di, ma na unu nādi ndu nime Kraist Jisus n'ebe Chineke nọ. 12 Ya mere, ka nmehie ghara idi nābu eze n'aru-unu nke puru inwu anwu, ime unu ka unu ṅa agu-ya nile nti: 13 unu adi-kwa-la nēche ihe di unu n'aru n'iru nmehie ka ha buru ihe-agha ajọ omume; kama chenu onwe-unu n'iru Chineke, dika ndi sitere na ndi nwuru anwu di ndu, che-kwa-nu ihe di unu n'aru n'iru Chineke ka ha buru ihe-agha ezi omume. 14 N'ihi na nmehie agaghi-abu onye-nwe-unu: n'ihi na unu anọghi n'okpuru iwu, kama n'okpuru amara. 15 Gini kwa? ọ̀ bu na ayi gēmehie, n'ihi na ayi anọghi n'okpuru iwu, kama n'okpuru amara? Chineke ekwela. 16 Ùnu amataghi na onye unu nēche onwe-unu n'iru ya ka unu buru ndi-orù iṅa ya nti, unu bu ndi-orù nke onye ahu unu nāṅa nti ya; ma-ọbu nke nmehie nēweta ọnwu, ma-ọ̀bu nke iṅa-nti nēweta ezi omume? 17 Ma ekele diri Chineke, na unu buri ndi-orù nke nmehie, ma unu sitere n'obi-unu ṅa nti ihe-atù nke ozizi ahu nke arara unu nye n'aka-ya; 18 ebe eme-kwa-ra ka unu pua na nmehie nwere onwe-unu, unu ghọrọ ndi-orù nke ezi omume. 19 Anamekwu dika madu n'ihi adighi-ike nke anu-aru-unu: n'ihi na dika unu chere ihe nile di unu n'aru n'iru adighi-ọcha na n'iru imebi-iwu nēdubà n'imebi-iwu ka unu buru ndi-orù-ha, otú a chenu ihe nile di unu n'aru n'iru ezi omume ub͕u a, bú nke nēdubà n'ido-nsọ, ka unu buru ndi-orù-ya. 20 N'ihi na mb͕e unu bu ndi-orù nke nmehie, unu nwere onwe-unu n'ebe ezi omume di. 21 Ọ̀ bu nkpuru gini kwa ka unu nwere n'oge ahu n'ihe nile ahu nke ihere ha nēme unu ub͕u a? n'ihi na ọgwugwu ihe nile ahu bu ọnwu. 22 Ma ub͕u a ebe unu pusiri na nmehie nwere onwe-unu, ghọ kwa ndi-orù nke Chineke, unu nwere nkpuru-unu nēweta ido-nsọ, unu nwe-kwa-ra ndu ebighi-ebi dika ọgwugwu-ya. 23 N'ihi na ugwọ-ọlu nke nmehie bu ọnwu; ma onyinye-amara nke Chineke bu ndu ebighi-ebi nime Kraist Jisus Onye-nwe-ayi.

Rom 7

1 Ma-ọbu ùnu amaghi, umu-nnam (n'ihi na anamagwa ndi mara iwu okwu), na iwu bu onye-nwe madu ka oge ra ọ nādi ndu? 2 N'ihi na iwu kekọrọ nwanyi nke nwere di n'aru di-ya mb͕e di-ya nọ na ndu; ma ọ buru na di-ya nwuru, atọpuwo ya n'iwu nke di-ya. 3 Ya mere otú a, agākpọ ya nwanyi nākwa iko, ma ọ buru na ọ lakuru nwoke di iche mb͕e di-ya nọ na ndu: ma ọ buru na di-ya nwuru, ọ puwo n'iwu nwere onwe-ya, nke nēme ya ka ọ ghara ibu nwanyi nākwa iko, ma ọ buru na ọ lakuru nwoke di iche. 4 Ya mere, umu-nnam, esite-kwa-ra n'aru Kraist me ka unu onwe-unu nwua n'ebe iwu di; ka unu we lakuru di di iche, bú Onye emere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, ka ayi we miara Chineke nkpuru. 5 N'ihi na mb͕e ayi nọ n'anu-aru, ọchichọ ọjọ nile nke diri nmehie nile ayi, nke sitere n'aka iwu ahu, nālusi ọlu ike n'ihe nile di ayi n'aru imiri ọnwu nkpuru. 6 Ma ub͕u a atọpuwo ayi n'iwu ahu, ebe ayi nwuru n'ebe ihe ahu di nke ejidesiri ayi ike nime ya; ya mere ayi nābu orù n'idi-ọhu nke Mọ Nsọ, ọ bughi kwa n'idi-ochie nke ihe edeworo n'akwukwọ. 7 Gini ka ayi gēkwu kwa? Ìwu ahu bu nmehie? Chineke ekwela. Kama, m'gaghi-amawori nmehie, ma ọ buru na esiteghm n'aka iwu mara ya: n'ihi na m'gaghi-amatawori agu ihe ọjọ, ma ọ buru na iwu ahu asighi, Agu ihe ọjọ agula gi: 8 ma nmehie, ebe ọ natara ihe ọ gēji megidem, o were ihe enyere n'iwu luta agu ihe ọjọ nile n'otù n'otù nimem: n'ihi na nmehie bu ihe nwuru anwu ma iwu adighi ya. 9 Ma mu onwem nādi ndu otù mb͕e n'oge iwu nādigh: ma mb͕e ihe enyere n'iwu biara, nmehie ahu we di ndu ọzọ, mu onwem we nwua; 10 ihe ahu enyere n'iwu, nke nēdubà na ndu, nka ka m'huru na ọ bu ihe nēdubà n'ọnwu: 11 n'ihi na nmehie, ebe ọ natara ihe ọ gēji megidem, o sitere n'ihe enyere n'iwu ghọb͕uem, site kwa na ya b͕uem. 12 Ya mere iwu ahu di nsọ n'ezie, ihe enyere n'iwu di kwa nsọ, zi kwa ezi, buru kwa ezi ihe. 13 Ya mere, èzi ihe ahu ghọrọ ọnwu n'ebe m'nọ? Chineke ekwela. kama ọ bu nmehie, ka o we puta ìhè na ọ bu nmehie, site n'iwere ezi ihe ahu lutaram ọnwu; ka nmehie we site n'ihe ahu enyere n'iwu ghọ ihe nēmehie nke-uku ri nne. 14 N'ihi na ayi matara na iwu ahu bu ihe nke Mọ: ma mu onwem bu ihe nke anu-aru, erewokwam inọ n'okpuru nmehie. 15 N'ihi na ihe m'nāluta ka m'nāmagh: n'ihi na ihe m'nāchọ, ọ bughi ihe ahu ka m'nēme; kama ihe m'nākpọ asì, ihe ahu ka m'nēme. 16 Ma ọ buru na ihe m'nāchọghi, ihe ahu ka m'nēme, anamekweye iwu ahu na ọ bu ihe ọma. 17 Ma ub͕u a ọ bughi mu onwem nāluta kwa ya ọzọ, kama ọ bu ihe ahu nke nēbi nimem, bú nmehie. 18 N'ihi na amataram na ezi ihe adighi-ebi nimem, nke ahu bu, n'anu-arum: n'ihi na ichọ ihe ọma di nso n'ebe akam gēru, ma iluta ihe ọma adighi nso n'ebe akam gēru. 19 N'ihi na ezi ihe nke m'nāchọ ka m'nēmegh: kama ihe ọjọ nke m'nāchọghi, ihe ahu ka m'nēme. 20 Ma ọ buru na ihe m'nachọghi, ihe ahu ka m'nēme, ọ bughi mu onwem nāluta kwa ya ọzọ, kama ọ bu ihe ahu nke nēbi nimem, bú nmehie. 21 Ya mere ahurum iwu a, na ihe ọjọ dim nso n'ebe akam gēru, mu, bú onye nāchọ ime ihe ọma. 22 N'ihi na mu na iwu Chineke nēnwekọ obi-utọ dika madu imem si di: 23 ma anamahu iwu di iche n'ihe nile dim n'aru, nēbu agha megide iwu nke uchem, nādọtakwam n'agha nye iwu nke nmehie nke di n'ihe nile dim n'aru. 24 Madu nke hujuru anya ka mu onwem bu! ònye gādọputam n'aru nke ọnwu a? 25 Ma ekele diri Chineke na ndọputa sitere n'aka Jisus Kraist Onye-nwe-ayi. Ya mere otú a mu onwem ji uchem buru orù nke iwu Chineke; ma ejim anu-arum buru orù nke iwu nmehie.

Rom 8

1 Ya mere ub͕u a ọ dighi amam-ikpe ọ bula diri ndi nọ nime Kraist Jisus. 2 N'ihi na iwu nke Mọ nke ndu nime Kraist Jisus mere ka m'pua n'aka iwu nke nmehie na nke ọnwu, nwere onwem. 3 N'ihi na ihe iwu ahu nāpughi ime, nke ọ nādighi ike nime ya site n'anu-aru, Chineke mere, n'ihi na Ọ mara nmehie ikpé n'anu-aru, mb͕e O zitere Ọkpara nke aka Ya n'oyiyi nke anu-aru nmehie na dika àjà achuru n'ihi nmehie: 4 ka ihe iwu ahu guru n'ihe ziri ezi we mezu nime ayi, bú ndi nādighi-eje dika anu-aru si chọ, kama dika Mọ Nsọ si chọ. 5 N'ihi na ndi di ka anu-aru si chọ nātukwasi uche n'ihe nke anu-aru; ma ndi di ka Mọ Nsọ si chọ nātukwasi uche n'ihe nke Mọ Nsọ. 6 N'ihi na itukwasi uche n'anu-aru bu ọnwu; ma itukwasi uche na Mọ Nsọ bu ndu na udo: 7 n'ihi na itukwasi uche n'anu-aru, ya na Chineke di n'iro; n'ihi na edoghi ya n'okpuru iwu Chineke, n'ihi na apughi kwa ido ya n'okpuru ya: 8 ndi nke nọ n'anu-aru apughi kwa itọ Chineke utọ. 9 Ma unu onwe-unu anọghi n'anu-aru, kama unu nọ nime Mọ Nsọ, ma ọ buru na ọbu ezie na Mọ nke Chineke nēbi nime unu. Ma ọ buru na onye ọ bula enweghi Mọ nke Kraist, onye ahu abughi nke Ya. 10 Ma ọ buru na Kraist nọ nime unu, aru-unu bu ihe nwuru anwu n'ihi nmehie n'ezie; ma Mọ Nsọ bu ndu n'ihi ezi omume. 11 Ma ọ buru na Mọ nke Onye ahu Nke mere ka Jisus si na ndi nwuru anwu bilie nēbi nime unu, Onye ahu Nke mere ka Kraist Jisus si na ndi nwuru anwu bilie gēsite kwa n'aka Mọ-Ya Nke nēbi nime unu me ka aru-unu nke puru inwu anwu di ndu. 12 Ya mere otú a, umu-nnam, ayi bu ndi ji ugwọ̀, ọ bughi anu-aru ka ayi ji, idi ndu dika anu-aru si chọ: 13 n'ihi na asi na unu nādi ndu dika anu-aru si chọ, unu gaje inwu; ma ọ buru na unu nēwere Mọ Nsọ me ka omume aru nwua, unu gādi ndu. 14 N'ihi na ka ha ra, bú ndi Mọ Chineke nēdú, ndi ahu bu umu-ndikom Chineke. 15 N'ihi na unu anataghi mọ nke ibu-orù ilaghachi n'egwù ọzọ; kama unu natara Mọ nke ido-ka-nwa-nwoke, Nke ayi nēti nkpu nime Ya, si, Aba, Nna. 16 Mọ Nsọ onwe-ya soro mọ-ayi nāb͕a àmà, na ayi bu umu Chineke: 17 ma ọ buru na ayi bu umu, ayi bu kwa ndi-nketa; ndi-nketa nke Chineke, na ndi ha na Kraist nēkekọ; ma ọ buru na ọ bu ezie na ayi na Ya nāhukọ ahuhu, ka ewe nyekọ kwa ayi na Ya otuto. 18 N'ihi na anamagu na ahuhu nile nke oge di ub͕u a ekwesighi ka ekwuta ha ma ele ebube ahu anya, bú nke agaje ikpughe n'ebe ayi nọ. 19 N'ihi na olile-anya siri ike nke ihe nile ekère èkè nēchesi nkpughe nke umu-ndikom Chineke ike. 20 N'ihi na edoro ihe ahu ekèrè èkè n'okpuru ihe-efu, ọ bughi na ọ chọrọ ya, kama n'ihi Onye ahu Nke doro ya n'okpuru ya n'olile-anya; 21 n'ihi na agēme ka ihe ekère èkè onwe-ya pu kwa n'ibu-orù nmebi ba n'ọnọdu inwe-onwe-ya nke ebube nke umu Chineke. 22 N'ihi na ayi matara na ihe ekère èkè nile nāsukọ udè, ime nēmekọ kwa ha, rue ub͕u a. 23 Ma ọ bughi nání nka, kama ayi onwe-ayi, ndi nwere nkpuru mbu nke Mọ Nsọ, ọbuná ayi onwe-ayi nāsu kwa udè nime onwe-ayi, mb͕e ayi nēchesi ido-ka-nwa-nwoke ahu ike, bú nb͕aputa nke aru-ayi. 24 N'ihi na ọ bu n'olile-anya ka azọputara ayi: ma olile-anya nke anāhu anya abughi olile-anya: n'ihi na ihe madu nāhu anya, gini mere o ji nēle anya ya? 25 Ma ọ buru na ayi nēle anya ihe ayi nāhughi anya, ayi ji ntachi-obi nēchesi ya ike. 26 Otù ahu Mọ Nsọ nēye-kwa-ra adighi-ike-ayi aka: n'ihi na ayi amataghi ihe ayi gēkpe n'ekpere dika ayi nāghaghi ikpe; kama ọ bu Mọ Nsọ onwe-ya were isu-udè anāpughi ikwu nāriọrọ ayi aririọ; 27 ma Onye ahu Nke nēnyocha obi-ayi matara ihe Mọ Nsọ nātukwasi uche na ya, n'ihi na Ọ nāriọrọ ndi nsọ aririọ dika Chineke si chọ. 28 Ma ayi matara na ihe nile nālukọ ọlu iwetara ndi huru Chineke n'anya ezi ihe, bú ndi akpọrọ dika ihe O nēzube si di. 29 N'ihi na ndi O buru uzọ mara, O bu-kwa-ra uzọ ka ha àkà, ka ha na onyinyo nke Ọkpara-Ya nwekọ otù udi, ka O we buru onye ebu uzọ mu n'etiti ọtutu umu-nna: 30 ma ndi O buru uzọ ka àkà, ndia ka Ọ kpọ-kwa-ra: ma ndi Ọ kpọrọ, ndia ka Ọ gu-kwa-ra na ndi ezi omume: ma ndi Ọ guru na ndi ezi omume, ndia ka O nye-kwa-ra otuto. 31 Gini kwa ka ayi gēkwu n'ile ihe ndia anya? Ọ buru na Chineke diri ayi, ònye nēmegide ayi? 32 Onye ahu Nke nāzọdoghi Ọkpara nke aka Ya, kama Ọ rara Ya nye n'ihi ayi nile, Ò gēsi aṅa ghara inye kwa ayi ihe nile n'amara ebe O weresiri Onye ahu nye ayi? 33 Ònye gēbo ndi Chineke rọputara ebubo? Ọ̀ bu Chineke Onye nāgu ha na ndi ezi omume? 34 Ònye bu onye ahu nke gāma ikpé? Ọ̀ bu Kraist Jisus Onye nwuru, ma nke kariri, emere Ya ka O si na ndi nwuru anwu bilie, Onye nọ n'aka-nri Chineke, Onye nāriọ-kwa-ra ayi aririọ? 35 Ònye gēkewapu ayi n'ihu-n'anya nke Kraist? Ọ̀ bu nkpab͕u, ma-ọbu oké nkpà, ma-ọbu nsob͕u, ma-ọbu oké unwu, ma-ọbu ib͕a-ọtọ, ma-ọbu ize-ndu, ma-ọbu mma-agha? 36 Dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, N'ihi Gi ka anēme ka ayi nwua ogologo ubọchi dum; Aguru ayi dika aturu ob͕ub͕u. 37 É-è, kama n'ihe ndia nile ayi nēmeribiga ókè site n'aka Onye ahu Nke huru ayi n'anya. 38 N'ihi na emewo ka m'kweye, na ọnwu, ma-ọbu ndu, ma-ọbu ndi-mọ-ozi, ma-ọbu ibu-isi di iche iche, ma-ọbu ihe di ub͕u a, ma-ọbu ihe gaje idi, ma-ọbu ike di iche iche, 39 ma-ọbu ihe di elu, ma-ọbu ihe di omimi, ma-ọbu ihe ọ bula ọzọ ekère èkè, agaghi-apu ikewapu ayi n'ihu-n'anya Chineke, nke di nime Kraist Jisus Onye-nwe-ayi.

Rom 9

1 Anamekwu ezi-okwu nime Kraist, ekwughi m okwu-ugha, akọ-na-uchem nēsokwam b͕a àmà nime Mọ Nsọ, 2 na enwerem oké ihe-nwuta na ihe-nb͕u nādighi-agwu n'obim. 3 N'ihi na anamekperi ekpere, ka mu onwem buru anathema pua n'ebe Kraist nọ n'ihi umu-nnem, ndi-ikwum dika anu-aru si di: 4 ebe ha bu ndi Israel; ndi nwe ido-ka-nwa-nwoke ahu, na ebube ahu, na ọb͕ub͕a-ndu nile, na inye-iwu ahu, na ikpe ekpere ahu n'ulo uku Chineke, na nkwa nile; 5 ndi nwe nna-ayi-hà, ndi Kraist-ayi si kwa n'etiti ha puta dika anu-aru si di, Onye bu Onye-isi ihe nile, bu kwa Chineke, Nke agọziworo rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen. 6 Ma ọ bughi dika agāsi na okwu Chineke adawo n'ala. N'ihi na ndi si n'Israel puta, ọ bughi ndi ahu nile bu Israel: 7 ọ bughi kwa ha nile bu umu, n'ihi na ha bu nkpuru Abraham: kama, Nime Aisak ka agākpọ nkpuru-gi aha. 8 Nke ahu bu, umu nke anu-aru-ya, ọ bughi ndia bu umu Chineke; kama umu nke nkwa ahu ka anāgu na nkpuru. 9 N'ihi na nka bu okwu nke nkwa, Dika oge a si di M'gābia, Sera gēnwe kwa nwa-nwoke. 10 Ma ọ bughi nání nka; kama Rebeka kwa, mb͕e ọ tusiri ime site n'otù onye, bú Aisak nna-ayi- 11 n'ihi na mb͕e akāmughi umu ahu, mb͕e ha akēmeghi kwa ihe ọ bula, ma ọ bu ezi ihe ma-ọbu ihe nādighi nma, ka ihe Chineke zubere dika nrọputa si di we digide, o siteghi n'ọlu, kama o sitere n'Onye nākpọ, 12 asiri ya, Nke-okenye gēfè nke-ntà. 13 Dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Jekob ka M'huru n'anya, ma Isọ ka M'kpọrọ asì. 14 Gini ka ayi gēkwu kwa? Ọ̀ gābu na ajọ omume di n'ebe Chineke nọ? Chineke ekwela. 15 N'ihi na Ọ si Moses, M'gēmere onye ọ bula ebere, bú onye M'nēmere ebere, M'gēnwe kwa obi-ebere n'aru onye ọ bula, bú onye M'gēnwe obi-ebere n'aru-ya. 16 Ya mere otú a ọ bughi nke onye nāchọ, ọ bughi kwa nke onye nāb͕a ọsọ, kama ọ bu nke Onye ahu Nke nēme ebere, bú Chineke. 17 N'ihi na ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nāsi Fero, Ọ bu n'ihi otù ihe a ka M'mere ka i bilie, ka M'we gosi ikem nime gi, ka ewe kwusa kwa aham n'uwa nile. 18 Ya mere otú a ọ bu onye Ọ nāchọ ka Ọ nēmere ebere, ọ bu kwa onye Ọ nāchọ ka ọ nēme ka o nwe obi-etili. 19 Ya mere i gāsim, Gini mere Ọ nọ nāta uta? N'ihi na ọ̀ bu onye nēguzogide ihe O zubere? 20 Ajuju kwesikariri iju, gi madu, bu, Gì onwe-gi bu onye, nke nāza Chineke okwu imegide Ya? Ọ̀ gābu na ihe akpuworo gāsi onye kpuru ya, Gini mere i kpurum otú a? 21 Ma-ọbu ọkpu-ite, ò nweghi ike n'ebe urọ di, isite n'otù ọkpukpu-urọ ahu o doziri me nka ka ọ buru ihe gānara nsọpuru, me kwa nke-ọzọ ka ọ buru ihe agēme ihe-ihere? 22 Gini kwa, ma ọ buru na Chineke, ọ bu ezie na Ọ nāchọ igosi iwe-Ya, na ime ka amara ike-Ya, ma O were ogologo-ntachi-obi ri nne nagide ihe iwe edoziworo ka ha bà n'ila-n'iyì: 23 ka O we me kwa ka amara àkù nke ebube-Ya n'aru ihe diri ebere, nke O buru uzọ dozie ka ha ba n'ebube, 24 bú ayi onwe-ayi, ndi Ọ kpọ-kwa-ra, ọ bughi site na nání ndi-Ju, kama site kwa na ndi mba ọzọ? 25 Dika O nēkwu kwa n'akwukwọ Hosea, si, M'gākpọ ndi ahu ndim, nke nābughi ndim; M'gākpọ kwa nwanyi ahu onye ahuru n'anya, nke anāhughi n'anya. 26 O gēru kwa, na n'ebe ahu nke asiri ha, Ọ bughi ndim ka unu bu, N'ebe ahu ka agākpọ ha umu-ndikom nke Chineke di ndu. 27 Ma Aisaia nēti nkpu bayere Israel, si, Ọ buru na ọnu-ọgugu umu Israel di ka ájá nke oké osimiri, ọ bu nke fọduru ka agāzọputa: 28 n'ihí na Onye-nwe-ayi gēme ihe O kwuru n'elu uwa, nēmezu ya nēme kwa ya ka o bìe. 29 Ọzọ, dika Aisaia buru uzọ kwue, Ọ buru na Onye-nwe usu nile nke ndi-agha arapughi ayi otù nkpuru, Ayi gādiwori ka Sọdọm, agēmewori ayi ka ayi yie Gọmọra. 30 Gini ka ayi gēkwu kwa? Na ndi mba ọzọ, ọ bu ezie na ha ab͕asoghi ezi omume, ma ha ruru ezi omume, ma ọ bu ezi omume ahu nke si n'okwukwe puta: 31 ma Israel, ọ bu ezie na ha nāb͕aso iwu ezi omume, ma ha ekwudoghi iwu ahu. 32 N'ìhi gini? N'ihi na ha esiteghi n'okwukwe chọ ya, kama dika agāsi na ha sitere n'ọlu chọ ya. Ha suru ngọngọ na nkume nke isu-ngọngọ-ha; 33 dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Le, anamatọb͕ọ nime Zaion nkume nke isu-ngọngọ, na oké nkume nke ima-n'ọnyà: Onye kwe-kwa-ra na Ya, agaghi-eme ka ihere me ya n'iru.

Rom 10

1 Umu-nnam, ihe di obim ezi nma na aririọ m'nāriọ Chineke n'ihi ha bu, ka azọputa ha. 2 N'ihi na anamab͕ara ha àmà na ha nānu ọku n'obi n'ebe Chineke nọ, ma ọ bughi dika nmazu si di. 3 N'ihi na, ebe ha nāmaghi ezi omume Chineke, nāchọ kwa uzọ ime ka ezi omume nke aka ha guzo, ha edoghi onwe-ha n'okpuru ezi omume Chineke. 4 N'ihi na Kraist bu nsọtu iwu iwetara onye ọ bula nke kwere ezi omume. 5 N'ihi na Moses edewo n'akwukwọ na madu nke nēme ezi omume nke sitere n'iwu gādi ndu nime ya. 6 Ma ezi omume ahu nke sitere n'okwukwe nēkwu otú a, si, Asila n'obi-gi, Ònye gārigo n'elu-igwe? (nke ahu bu, ikudata Kraist: ) 7 ma-ọbu, Ònye gārida n'abyss ahu? (nke ahu bu, isi na ndi nwuru anwu kugota Kraist. ) 8 Kama ọ̀ bu gini ka ọ nēkwu? Okwu ahu di gi nso, n'ọnu-gi, na n'obi-gi: nke ahu bu, okwu okwukwe, nke ayi nēkwusa: 9 na ọ buru na i gēwere ọnu-gi kwuputa Jisus na Ọ bu Onye-nwe-ayi, ọ buru kwa na i gēwere obi-gi kwere na Chineke mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, agāzọputa gí: 10 n'ihi na anēji obi kwere rue ezi omume; anēji kwa ọnu kwuputa rue nzọputa. 11 N'ihi na ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nāsi, Onye ọ bula nke kwere na Ya, agaghi-eme ka ihere me ya. 12 N'ihi na ọ dighi ihe di iche n'etiti onye-Ju na onye-Grik: n'ihi na otù Onye-nwe-ayi ahu bu Onye-nwe ọra madu, buru kwa Onye nwere àkù ri nne inye ndi nile nākpọku Ya: 13 n'ihi na, Onye ọ bula nke gākpọku aha Onye-nwe-ayi, agāzọputa ya. 14 Hà gēsi kwa aṅa kpọku Onye ahu ha akēkweghi na Ya? ma hà gēsi aṅa kwere n'Onye ahu ha akānughi okwu-Ya? ma hà gēsi aṅa nu ma onye nēkwusa anọghi? 15 ma hà gēsi aṅa kwusa, ma ọ buru na ezigaghi ha? dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Le, ka ha si ma nma nke-uku, bú ukwu ndi nēzisa ozi ọma nke ezi ihe! 16 Ma ọ bughi ha nile ṅara ozi ọma ahu nti. N'ihi na Aisaia nāsi, Onye-nwe-ayi, ònye kwere ihe ayi nuworo? 17 Ya mere, okwukwe si n'ọnunu puta, ma ọnunu ahu sitere n'okwu Kraist. 18 Ma asim, Ọ̀ gābu na ha anughi? Ha nuru ezie, N'uwa nile ka olu-ha puru jezue, Na nsọtu nile nke elu-uwa dum madu bi ka okwu-ha puwo-kwa-ra jezue. 19 Ma asim, Ọ̀ gābu na Israel amaghi? Moses buru uzọ si, Mu onwem gēwere mba nābughi mba kpasue unu ekworo, Mba nēnweghi nghọta ka M'gēwere kpasue unu iwe. 20 Ma Aisaia nwere anya-ike nke-uku, we si, Ndi nāchọghm chọtaram; Ewerem gosi ndi nājughi ajuju n'akam. 21 Ma Ọ nēkwu okwu bayere Israel, si, Ogologo ubọchi dum ka M'b͕asara akam nye ndi nādighi-ekwenye, ndi nēkwugidekwam.

Rom 11

1 Ya mere asim, Ọ̀ gābu na Chineke nupuru ndi nke Ya? Chineke ekwela. N'ihi na mu onwem bu kwa onye Israel, si na nkpuru Abraham puta, si kwa n'ebo Benjamin puta. 2 Chineke enupughi ndi-Ya nke O buru uzọ mara. Ma-ọbu ùnu amataghi ihe ọ nēkwu, bú ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, n'ebe edeworo okwu bayere Elaija? otú ọ nāriọ Chineke aririọ megide Israel, si, 3 Onye-nwe-ayi, ha b͕uru ndi-amuma-Gi, ha gwudara ebe-ichu-àjà-Gi nile: nání mu onwem fọdu-kwa-ra, ha nāchọ kwa ndum. 4 Ma gini ka ndum-ọdu Chineke nāgwa Ya? Arapurum nye Onwem nnù ndikom iri-na-asa na ọgu iri, madu ndi ọ dighi mb͕e ha b͕uru ikperè nye Beal. 5 Ya mere otú a n'oge di ub͕u a ndi fọduru aputawo kwa dika nrọputa nke amara si di. 6 Ma ọ buru na ọ di n'amara, o siteghi kwa ọzọ n'ọlu: ebe ahuru na amara abughi amara ọzọ, ma asi na ọ dighi otú a. 7 Gini kwa? Ihe Israel nāchọ, nke ahu ka ọ nāhughi; ma nrọputa ahu huru ya, ma emere ka obi ndi fọduru me etili: 8 dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Chineke nyere ha mọ nke oké ura, anya ighara ihu uzọ, na nti ighara inu ihe, rue ubọchi ta. 9 Devid nāsi kwa, Ka table-ha ghọ ib͕udu, na ihe eji achu ha ntà, Na ọnyà, na ihe-nnyeghachi n'ebe ha nọ: 10 Ka anya-ha b͕a ọchichiri, ka ha we ghara ihu uzọ, Gi me kwa ka azú-ha ruru mb͕e nile. 11 Ya mere m'nāsi, Ọ̀ gābu na ha suru ngọngọ ka ha we da? Chineke ekwela: kama nzọputa sitere na ndahie-ha ru ndi mba ọzọ aka, ka ewe kpasue ha ekworo. 12 Ma ọ buru na ndahie-ha bu àkù nke uwa, ọ buru kwa na ila-ala-ha bu àkù nke ndi mba ọzọ; òzùzù-ha gēsi aṅa ghara ibu kari àkù-ha nke-uku? 13 Ma ọ bu unu ndi mba ọzọ ka m'nāgwa okwu, (n'ezie, ka ọ ra, bú onye-ozi nke ndi mba ọzọ mu onwem bu, anamenye ije-ozim otuto): 14 ma ọ buru na agamakpasu ndi-arum ekworo n'uzọ ọ bula, we zọputa ufọdu n'etiti ha. 15 N'ihi na asi na nchupu-ha bu ime ka uwa na Chineke di n'otù, gini ka nkpọbata-ha gābu, ma-ọbughi ndu sitere na ndi nwuru anwu? 16 Ma ọ buru na nkpuru mbu di nsọ, ob͕e utu ọka agwọrọ agwọ di kwa nsọ: ọ buru kwa na nkpọrọgwu di nsọ, alaka di kwa nsọ. 17 Ma ọ buru na anyakapuru alaka ufọdu, ma gi onwe-gi, ọ bu ezie na i bu osisi olive nke ọhia, ma anyakudoro gi n'etiti ha, i ghọ-kwa-ra onye gi na ha nēnwekọ nkpọrọgwu nke umi nke olive ahu; 18 anyalara alaka ahu isi: ma ọ buru na i nānyara ha isi, ọ bughi gi onwe-gi nēbu nkpọrọgwu, kama ọ bu nkpọrọgwu nēbu gi. 19 Ya mere i gāsi, Anyakapuru alaka ufọdu ka ewe nyakudo mu onwem. 20 Ọ di nma; n'ekweghi-ekwe-ha ka anyakapuru ha, ma gi onwe-gi nēguzo n'okwukwe-gi. Atukwasila uche-gi n'ihe di elu, kama nātu egwu: 21 n'ihi na asi na Chineke emeghi alaka ahu osisi olive ji puta uwa ebere, Ọ gaghi-eme kwa gi ebere. 22 Ya mere le obi-ọma na aka-ike nke Chineke: n'aru ndi ndi a ka aka-ike-Ya dakwasiri; ma n'aru gi ka obi-ọma Chineke nādikwasi, ma ọ buru na i gānọgide n'obi-ọma-Ya: ebe agēbipu kwa gi onwe-gi ma ọ buru na i nọgideghi otú a. 23 Ndi ahu kwa, ma ọ buru na ha anọgideghi n'ekweghi-ekwe-ha, agānyakudo ha: n'ihi na Chineke puru inyakudo ha ọzọ. 24 N'ihi na asi na ebipuru gi onwe-gi n'osisi olive nke bu nke ọhia ka o si puta uwa, ewe nyakudo gi n'osisi olive ọma n'uzọ nke nēmegide ka o si puta uwa: àgēsi aṅa ghara inyakudo kari ndi ahu nke-uku, bú alaka osisi olive ji puta uwa, n'osisi olive nke aka ha? 25 N'ihi na achọghm ka unu ghara ima ihe-omimi a, umu-nnam, ka unu ghara inwe uche n'anya onwe-unu, na emewo Israel obi-etili ufọdu, rue mb͕e ozùzù ndi mba ọzọ gābata; 26 otú a agāzọputa kwa Israel nile: dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye-ndọputa ahu gēsi na Zaion puta; Ọ gēchighari asọpurughi-Chineke nile ka ọ pua na Jekob: 27 Nka bu kwa ọb͕ub͕a-ndu gādiri ha site n'ebe M'nọ, Mb͕e ọ bula M'gēwepu nmehie nile ha. 28 N'akuku ozi ọma, ha bu ndi-iro n'ihi unu: ma n'akuku nrọputa, ha bu ndi ahuru n'anya n'ihi nna-ayi-hà. 29 N'ihi na nchèghari adighi n'onyinye-amara nile na ọkpukpọ nke Chineke. 30 N'ihi na dika unu onwe-unu nēkweyeghi Chineke n'oge gara aga, ma ub͕u a emere unu ebere n'ekweyeghi-ekweye nke ha, 31 otú a ka ndia nēkweyeghi kwa ub͕u a, ka ewe were ebere emere unu mere ha onwe-ha ebere ub͕u a. 32 N'ihi na Chineke mechibidoro ha nile nime ekweyeghi-ekweye, ka O we mere ha nile ebere. 33 A! omimi nke àkù nke amam-ihe na nke ihe-ọmuma kwa nke Chineke! le otú anēnweghi ike ichọputa ikpé-Ya nile, otú anēnweghi kwa ike ituputa uzọ-Ya nile! 34 N'ihi na ònye mara uche Onye-nwe-ayi? ma-ọbu ònye putara ibu onye Ya na ya nāb͕a izù? 35 ma-ọbu ònye buru uzọ nye Ya, agēnyeghachi kwa ya ọzọ? 36 N'ihi na ihe nile sitere nime Ya, site kwa n'aka-Ya, di-kwa-ra Ya. Ọ bu Ya ka otuto diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.

Rom 12

1 Ya mere, umu-nnam, ejim obi-ebere nile nke Chineke nāriọ unu, ka unu che aru-unu n'iru Chineke, dika àjà di ndu, di nsọ, nke di Chineke ezi utọ, nke bu ikpe-ekpere-unu dika uche si di. 2 Unu ekwe-kwa-la ka eme ka unu yie ajọ oge a: kama ka enwogha unu site n'ime ka uche-unu buru ihe ọhu, ka unu we nwaputa ihe bu ihe Chineke nāchọ, bú ezi ihe nke di kwa Ya ezi utọ nke zu-kwa-ra okè. 3 N'ihi na esiterem n'amara nke enyerem si onye ọ bula nọ n'etiti unu, ka ọ ghara itukwasi uche n'onwe-ya kari nke o kwesiri itukwasi uche; kama itukwasi uche n'inwe uche zuru okè, dika Chineke kère ọtùtù nke okwukwe nye madu nile n'otù n'otù. 4 N'ihi na ọbuná dika ayi nwere ọtutu ihe n'otù aru, ma ihe ahu nile di n'aru enweghi otù ọlu: 5 otú a ayi, ndi di ọtutu, bu otù aru nime Kraist, buru kwa n'otù n'otù ihe di n'aru ibe-ayi. 6 Ma ebe ayi nwere onyinye-amara di iche iche dika amara nke enyere ayi si di, ma ayi nwere ibu-amuma, ka ayi nēbu amuma ka okwukwe-ayi ra; 7 ma-ọbu ije-ozi, ka ayi nānọ n'ije-ozi-ayi; ma-ọbu onye nēzi ihe, ya nọ n'ozizi-ya; 8 ma-ọbu onye nākasi obi, ya nọ na nkasi-obi-ya: onye nēme ka ndi ọzọ keta ihe o nwere, ya were afọ-ofufo me ya; onye bu onye-isi, ya were obi nānu ọku nābu isi; onye nēme ebere, ya were obi-utọ me ya. 9 Ka ihu-n'anya buru ihe nke iru-abua nādighi nime ya. Nākpọnu ajọ ihe asì; nārapara ezi ihe n'aru. 10 N'akuku ihu-n'anya-unu n'ebe umu-nna-unu nọ, ka ihe madu-ibe-unu nātọrita unu utọ nke-uku; n'akuku nsọpuru-unu, nācharanu ibe-unu uzọ; 11 n'akuku inu-ọku nke obì-unu, nāgharanu idi ọ̀bọ̀; n'akuku mọ-unu, nādinu ọku; n'akuku Onye-nwe-ayi, nābunu orù; 12 n'akuku olile-anya-unu, nāṅurinu ọṅu; n'akuku nkpab͕u-unu, nēnwenu ntachi-obi; n'akuku ekpere-unu, nānọgidesinu ike; 13 n'akuku ihe nākpà ndi nsọ, nēnwekọnu ihe; nāb͕asonu ọlu ile ndi-ọbìa anya nke-ọma. 14 Nāgọzinu ndi nēsob͕u unu; nāgọzinu, abu-kwa-la ha ọnu. 15 Nēsonu ndi nāṅuri n'iṅuri ọṅu; nēsonu ndi nākwa ákwá n'ikwa ákwá. 16 Nātukwasinu uche n'otù ihe ahu n'ebe ibe-unu nọ. Unu atukwasila uche n'ihe di elu, kama ka ndi ọnọdu-ha di ala nādọrọ unu iso ha. Unu enwela uche n'anya onwe-unu. 17 Unu enyeghachila onye ọ bula ihe ọjọ n'ọnọdu ihe ọjọ. Burunu uzọ nēchè ihe ọma n'iru madu nile. 18 Asi na ọ bu ihe gēkwe unu, ka ihe nke diri unu onwe-unu ra, unu na madu nile nādi n'udo. 19 Ndi m'huru n'anya, unu abọlara onwe-unu ọ́bọ̀, kama charanu iwe ahu uzọ: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Mu nwe ọ́bọ̀; Mu onwem gēnyeghachi, ka Onye-nwe-ayi kwuru. 20 Ma ọ buru na agu nāgu onye-iro-gi, nāzù ya; ọ buru na akpiri nākpọ ya nku, gi me ka ọ ṅua miri: n'ihi na n'ime nka i gāgukwasi icheku nēre ọku n'isi-ya. 21 Ekwela ihe ọjọ meri gi, kama were ezi ihe meri ihe ọjọ.

Rom 13

1 Ka nkpuru-obi ọ bula do onwe-ya n'okpuru ndi nāchi isi n'elu ya: n'ihi na ọ dighi onye ọ bula nāchi isi ma ọ buru na Chineke edoghi ya; ndi nāchi isi bu kwa ndi Chineke doworo. 2 Ya mere onye nēdo onwe-ya megide onye ahu nāchi isi, ọ nēguzogide iwu Chineke nyere: ma ndi nēguzogide gānata ikpé nye onwe-ha. 3 N'ihi na ndi-isi abughi ihe-egwu n'ebe ezi ọlu di, kama n'ebe ọlu ọjọ di. Ma ì chọghi ka i tua egwu onye ahu nāchi isi? nēme ezi ihe, i gēnwe kwa otuto site n'aka ya: 4 n'ihi na ọ bu onye nējere Chineke ozi n'ebe i nọ iwetara gi ezi ihe. Ma ọ buru na i nēme ihe ọjọ, tua egwu; n'ihi na ọ bughi n'efu ka o nēbu mma-agha: n'ihi na ọ bu onye nējere Chineke ozi, onye-ọ́bọ̀ iwetara onye nēme ihe ọjọ iwe. 5 N'ihi ya ọ di nkpà ido onwe-unu n'okpuru ya, ọ bughi nání n'ihi iwe ahu, kama ọ bu kwa n'ihi akọ-na-uche. 6 N'ihi na ọ bu n'ihi nka ka unu nātu kwa ùtú; n'ihi na ha bu ndi nēfè Chineke òfùfè, nānọgidesi ike n'ọlu-ha ime otù ihe a. 7 Nākwughachinu madu nile ihe nile unu ji ha n'ugwọ: tunu ùtú nye onye unu ji ugwọ ùtú; tunu ùtú-ahia nye onye unu ji ugwọ ùtú-ahia; tuanu egwu onye unu ji ugwọ egwu; sọpurunu onye unu ji ugwọ nsọpuru. 8 Unu ejila onye ọ bula ugwọ ọ bula, ma-ọbughi ihurita onwe-unu n'anya: n'ihi na onye nāhu madu-ibe-ya n'anya edebezuwo iwu. 9 N'ihi na okwu a, Akwala iko, Eb͕ula madu, Ezula ori, Agu ihe ọjọ agula gi, ọ buru kwa na ihe ọ bula ọzọ di enyere n'iwu, achikọtara ya n'okwu a, bú, Hu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi. 10 Ihu-n'anya adighi-alu ọlu ọjọ n'ebe onye-ab͕ata-obi-ya nọ: ya mere ihu-n'anya bu idebezu iwu. 11 Nke ahu kwa, ebe unu matara oge a, na oge hour eruwo ub͕u a ka unu teta n'ura: n'ihi na ub͕u a nzọputa-ayi di nso kari mb͕e ayi kwere na mbu. 12 Chi ejimiwo, chi-ọbubọ di kwa nso: ya mere ka ayi yipu ọlu nile nke ọchichiri, ma ka ayi yikwasi ihe-agha nke ihè. 13 Ka ayi nējeghari dika ọ kwesiri ayi, dika n'ehihie; ọ bughi n'ite-egwú na iṅubiga-manya-ókè, ọ bughi n'ikwa-iko na agu ikwa-iko, ọ bughi n'esem-okwu na ekworo. 14 Kama yikwasinu Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, unu ebu-kwa-la uzọ nēchère aru, ime ihe ọjọ nāgu ya.

Rom 14

1 Ma kpọbatanu onye nādighi ike n'okwukwe-ya, ọ bughi ikpa ókè n'ihe ọ nātule n'obi. 2 Otù onye nwere okwukwe iri ihe nile: ma onye nādighi ike nēri nání ihe anāku n'ubi. 3 Ka onye nēri ihe ghara ikpọ onye nādighi-eri ihe-efu; ka onye nādighi-eri ghara kwa ikpe onye nēri ikpé: n'ihi na Chineke kpọbatara ya. 4 Gi onwe-gi nke nēkpe onye nējere onye ọzọ ozi, i bu onye? ọ bu n'ebe Onye-nwe ya onwe-ya nọ ka ọ nēguzo ma-ọbu nāda. Ma agēme ya ka o guzo; n'ihi na Onye-nwe-ayi puru ime ya ka o guzo. 5 Otù onye nārọputa otù ubọchi kari ubọchi ọzọ: ma onye ọzọ nārọputa ubọchi dum. Ka onye ọ bula nēkwezu nime uche nke aka ya. 6 Onye nātukwasi uche n'ubọchi, nātukwasi uche na ya n'ebe Onye-nwe-ayi nọ: onye nēri kwa, nēri n'ebe Onye-nwe-ayi nọ, n'ihi na ọ nēkele Chineke; onye nādighi-eri kwa, n'ebe Onye-nwe-ayi nọ ka ọ nādighi-eri, ọ nēkele kwa Chineke. 7 N'ihi na ọ dighi onye ọ bula n'etiti ayi nke di ndu n'ebe ya onwe-ya nọ, ọ dighi kwa onye ọ bula nwuru anwu n'ebe ya onwe-ya nọ. 8 N'ihi na asi na ayi di ndu, ọ bu n'ebe Onye-nwe-ayi nọ ka ayi di ndu; ma asi na ayi nwuru, ọ bu n'ebe Onye-nwe-ayi nọ ka ayi nwuru: ya mere, ma ayi di ndu, ma ayi nwuru anwu, ayi bu ndi nke Onye-nwe-ayi. 9 N'ihi na ihe Kraist ji nwua, di kwa ndu ọzọ, bu nka, ka O we buru Onye-nwe ma ndi nwuru anwu ma ndi di ndu. 10 Ma gi onwe-gi, gini mere i nēkpe nwa-nna-gi ikpé? ma-ọbu gi onwe-gi kwa, gini mere i nākpọ, nwa-nna-gi ihe-efu? n'ihi na ayi nile gēguzo n'iru oche-ikpé Chineke. 11 N'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Dika Mu onwem nādi ndu, ka Onye-nwe-ayi kwuru, ọ bu Mu onwem ka ikperè nile ọ bula gēb͕uru, Ire nile ọ bula gēkwuputa kwa Chineke. 12 Ya mere otú a onye ọ bula n'etiti ayi gāza ajuju bayere onwe-ya nye Chineke. 13 Ya mere ka ayi ghara ikperita ibe-ayi ikpé ọzọ: ma kama ya kpenu ikpé a, ka onye ọ bula ghara idebe ihe-isu-ngọngọ, ma-ọbu ọnyà, n'uzọ nwa-nna-ya. 14 Amataram, eme-kwa-ra ka m'kweye nime Onye-nwe-ayi Jisus, na ọ dighi ihe ruru árú site n'onwe-ya: ọ bu nání n'ebe ọ nọ, bú onye nāgu ihe ọ bula na ọ ruru árú, n'ebe onye ahu nọ ka ọ ruru árú. 15 N'ihi na asi na n'ihi ihe-oriri ọ nēwuta nwa-nna-gi, i dighi-ejeghari ọzọ dika ihu-n'anya si di. Ewela ihe-oriri-gi la onye ahu n'iyì, bú onye Kraist nwuru n'ihi ya. 16 Ya mere unu ekwela ka ekwulu ezi ihe-unu: 17 n'ihi na ala-eze Chineke abughi oriri na ọṅuṅu, kama ọ bu ezi omume na udo na ọṅù nime Mọ Nsọ. 18 N'ihi na onye nābu orù Kraist n'uzọ nka, ọ di Chineke ezi utọ, buru kwa onye anwaputara n'iru madu. 19 Ya mere otú a, ka ayi nāb͕aso ihe nile diri udo, na ihe nile diri iwulirita onwe-ayi elu dika ulo. 20 Akwatula ọlu Chineke n'ihi ihe-oriri. Ihe nile di ọcha n'ezie; ma ihe ọ bula buru madu ahu ihe ọjọ, onye were ihe-isu-ngọngọ nēri ya. 21 Ọ di nma ka i ghara iri anu, ma-ọbu iṅu manya-vine, ma-ọbu ime ihe ọ bula nke nwa-nna-gi gāsu ngọngọ nime ya. 22 Okwukwe ahu nke gi onwe-gi nwere, nwe ya n'onwe-gi n'iru Chineke. Ngọzi diri onye nēkpeghi onwe-ya ikpé n'ihe ọ nānwaputa. 23 Ma onye nwere obi abua, amawo ya ikpé ma o rie, n'ihi na o siteghi n'okwukwe rie; ma ihe ọ bula nke nēsiteghi n'okwukwe bu nmehie.

Rom 15

1 Ma ayi onwe-ayi, bú ndi nwere ike, ayi aghaghi ibū adighi-ike nile nke ndi nēnweghi ike, na ighara ime ihe nātọ onwe-ayi utọ. 2 Onye ọ bula n'etiti ayi, ya me ihe gātọ onye-ab͕ata-obi-ya utọ iwetara ya ezi ihe, ka ọ we wulie ya elu dika ulo. 3 N'ihi na Kraist-ayi emeghi kwa ihe tọrọ Onwe-ya utọ; kama, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, Ita-uta nile nke ndi nāta Gi uta dakwasirim. 4 N'ihi na ka ha ra, bú ihe edere n'akwukwọ nsọ n'oge gara aga, edere ha izí ayi ihe, ka ayi we were ntachi-obi na nkasi-obi nke ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ nwe olile-anya. 5 Ma ka Chineke nke ntachi-obi na nke nkasi-obi nye unu ka unu tukwasi uche n'otù ihe ahu n'etiti-onwe-unu dika Kraist Jisus si chọ: 6 ka unu we ji otù obi ji kwa otù olu nēnye Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist otuto. 7 N'ihi ya nākpọbatanu ibe-unu, dika Kraist-ayi kpọbata-kwa-ra unu, ka ewe nye Chineke otuto. 8 N'ihi na asim na emewo Kraist ka Ọ buru onye nējere obibì-úgwù ozi n'ihi ezi-okwu Chineke, ka O we me ka nkwa nile ekwere nna-ayi-hà guzosie ike, 9 ka ndi mba ọzọ we nye kwa Chineke otuto n'ihi ebere-Ya; dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, N'ihi nka ka M'gēkwuputa Gi n'etiti mba nile, Aha-Gi ka m'gābùku kwa abù ọma. 10 Ọzọ kwa Ọ si, Unu mba ọzọ, soronu ndi-Ya nwe obi-utọ. 11 Ọzọ kwa, Tonu Onye-nwe-ayi, unu mba nile; Ka ndi nile di iche iche nāja kwa Ya. 12 Ọzọ kwa, Aisaia si, Nkpọrọgwu ahu nke Jesi gādi, Na onye ahu Nke nēbili ibu onye-isi mba nile; Onye ahu ka ndi mba ọzọ gēle anya Ya. 13 Ma Chineke nke olile-anya ahu mejue unu n'ọṅù nile na udo nile n'ikwe-ekwe, ka unu we nwebiga olile-anya ahu ókè, n'ike Mọ Nsọ. 14 Ma emewom ka m'kweye, umu-nnam, ọbuná mu onwem, ihe bayere unu, na unu onwe-unu juputara n'idi-nma, na emejuwo kwa unu n'ihe-ọmuma nile, na unu pu-kwa-ra idurita onwe-unu ọdú. 15 Ma ejikaririm anya-ike degara unu akwukwọ n'otù akuku, dika ọ bu ichetara unu ọzọ, n'ihi amara nke Chineke nyerem, 16 ka m'we buru onye nēfè Kraist Jisus òfùfè ijekuru ndi mba ọzọ, nālu kwa ọlu onye-nchu-àjà nke ozi ọma Chineke, ka ewe me ka iche-ndi-mba-ọzọ-n'iru-Chineke buru ihe agānara nke-ọma, ebe edoro ya nsọ nime Mọ Nsọ. 17 Ya mere enwerem inya-isim nime Kraist Jisus n'ihe nile diri Chineke. 18 N'ihi na m'gaghi-enwe anya-ike ikwu ihe o bula ma-ọbughi n'ihe nile Kraist lutara site n'akam, ime ka ndi mba ọzọ ṅa nti, n'okwu na ọlu, 19 n'ike nke ihe-iriba-ama na ọlu-ebube di iche iche, n'ike nke Mọ Nsọ; ya mere site na Jerusalem, na ala nke di ya gburugburu rue Ilirikọm, ezìzuwom ozi ọma Kraist; 20 ma nka ka m'mere nējisi ike izisa ozi ọma ahu otú a, ọ bughi ebe akpọrọri aha Kraist, ka m'ghara iwu ulo n'elu ntọ-ala onye ọzọ; 21 kama, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, Ha gāhu, bú ndi akākọghi akukọ Ya mb͕e ọ bula, Ndi akānughi kwa gāghọta. 22 N'ihi nka eb͕ochi-kwa-ram ọtutu oge ndia ibiakute unu: 23 ma ub͕u a, ebe m'nēnweghi ebe ọ bula n'akuku ndia ọzọ, ebe ibiakute unu nāgusikwam ike ọtutu arọ ndia gara aga, 24 mb͕e ọ bula m'gāga Spain (n'ihi na anamele anya na m'gēkiri unu mb͕e m'nāgabiga, anamele kwa anya na unu gēdupum n'ijem iga ebe ahu, ma ọ buru na afọ gēburu uzọ jum n'aru unu n'akuku ufọdu) 25 ma ub͕u a, ka m'kwuru, agam Jerusalem, ebe m'nējere ndi nsọ ozi. 26 N'ihi na ọ di Masedọnia na Akaia ezi nma inye ndi-ob͕eye n'etiti ndi nsọ nọ na Jerusalem ihe ufọdu ha gēnwekọ. 27 N'ihi na ọ di ha ezi nma; ha bu kwa ndi ji ndi ahu ugwọ. N'ihi na asi na ndi mba ọzọ nwekọrọ ihe Mọ Nsọ nke ha, ha ji kwa ugwọ ifè ha òfùfè n'ihe nke anu-aru. 28 Ya mere mb͕e m'mezusiri nka, ka-kwa-ra ha nkpuru a akàrà, m'gēsi na nke unu je Spain. 29 Ma amataram na, mb͕e m'biakutere unu, ọ bu nime ozuzù ngọzi nke Kraist ka m'gābia. 30 Ma, umu-nnam, ewerem Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, were kwa ihu-n'anya Mọ Nsọ, nāriọ unu, ka unu som nāb͕asi nb͕a ike n'ekpere unu nēkpere Chineke n'ihim; 31 Ka ewe dọputam n'aka ndi nēkweyeghi ekwenye ndi nọ na Judia, ka ije-ozim nke m'ji je Jerusalem we búru kwa ihe ndi nsọ gānara nke-ọma; 32 ka m'we biakute unu n'ọṅù site n'ọchichọ Chineke, ka mu na unu we zukọ kwa ike. 33 Ma ka Chineke nke udo nọyere unu nile. Amen.

Rom 16

1 Ma anameme ka unu mara Fibi nwa-nna-ayi nwanyi, onye nējere nzukọ Kraist nke di na Kenkrii ozi: 2 ka unu we nara ya nke-ọma nime Onye-nwe-ayi, dika o kwesiri ndi nsọ, ka unu nēguzo kwa ya nso iyere ya aka n'okwu ọ bula nkpà unu gākpa ya: n'ihi na ya onwe-ya aburuwo kwa onye nēguzoro ọtutu madu izọ ha, mu onwem kwa. 3 Kelenu Priska na Akwila ndi mu na ha nālukọ ọlu nime Kraist Jisus, 4 madu ndi tọb͕ọrọ olu nke aka ha n'ihi ndum; ndi ọ bughi nání mu onwem nēkele, kama nzukọ Kraist nile nke ndi mba ọzọ kwa: 5 kele-kwa-nu nzukọ Kraist nke di n'ulo-ha. Kelenu Epinetọs onye m'huru n'anya, onye bu nkpuru mbu nke Esia nye Kraist. 6 Kelenu Meri, n'ihi na ọ dọb͕uru onwe-ya n'ọlu n'ọtutu ihe nye unu. 7 Kelenu Andrọnaikọs na Junias, ndi-ikwum, ndi adọkọ-kwa-ra mu na ha n'agha, madu ndi amara aha-ha n'etiti ndi-ozi, ndi bu-kwa-ram uzọ bia nọ nime Kraist. 8 Kelenu Amplietọs, onye m'huru n'anya nime Onye-nwe-ayi. 9 Kelenu Uabenọs, onye ayi na ya nālukọ ọlu nime Kraist, na Stakis onye m'huru n'anya. 10 Kelenu Apelis onye anwaputaworo nime Kraist. Kelenu ndi sitere n'èzí-na-ulo nke Aristọbulọs. 11 Kelenu Hirọdion onye-ikwum. Kelenu ndi sitere n'èzi-na-ulo nke Nasisọs, ndi nọ nime Onye-nwe-ayi. 12 Kelenu Traifina na Traifosa ndi nādọb͕u onwe-ha n'ọlu nime Onye-nwe-ayi. Kelenu Pasis onye ahuru n'anya, n'ihi na ọ dọb͕uru onwe-ya n'ọlu n'ọtutu ihe nime Onye-nwe-ayi. 13 Kelenu Rufọs onye arọputara nime Onye-nwe-ayi, na nne-ya nke bu kwa nnem. 14 Kelenu Asinkritọs, Flegon, Hamis, Patrọbas, Hamas, na umu-nna ndi ha na ha nọ. 15 Kelenu Filọlọgọs na Julia, Nireọs na nwa-nne-ya nwayi, na Ọlimpas, na ndi nsọ nile ndi ha na ha nọ. 16 Werenu isutu-ọnu di nsọ kelerita onwe-unu. Nzukọ Kraist nile nēkele unu. 17 Ma anamariọ unu, umu-nnam, ka unu le ha anya, bú ndi nēweta nkewa di iche iche ahu na ọnyà di iche iche ahu, nēmegide ozizí nke unu onwe-unu mutara: ka unu nēze kwa ha. 18 N'ihi na ndi di otú a abughi orù nke Onye-nwe-ayi Kraist, kama orù nke afọ nke ha; ha were kwa okwu utọ ha na okwu ọma ha nāghọb͕u obi ndi nāmaghi ihe ọjọ. 19 N'ihi na iṅa-nti-unu eruzuwo na nti madu nile. Ya mere anamaṅuri ọṅu n'isi unu: ma anamachọ ka unu buru ndi-amam-ihe n'ebe ezi ihe di, ma ndi arughi-árú n'ebe ihe ọjọ di. 20 Ma Chineke nke udo gāzọpia Setan n'okpuru ukwu-unu ọsọsọ. Amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist diyere unu. 21 Timọti onye mu na ya nālukọ ọlu nēkele unu; na Lusiọs na Jeson na Sosipata, ndi-ikwum. 22 Mu onwem, bú Tatiọs, onye nēde akwukwọ-ozi a, nēkele unu nime Onye-nwe-ayi. 23 Gaiọs, onye nēlem na nzukọ Kraist dum ọbìa, nēkele unu. Erastọs onye nāchi ihe obodo nēkele unu, na Kwọtọs nwa-nna-ayi. 24 Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist diyere unu nile. Amen. 25 Ma Onye ahu Nke puru ime ka unu guzosie ike dika ozi ọmam na nkwusa nke Jisus Kraist si di, dika nkpughe nke ihe-omimi ahu si di nke emeworo ka o kpuchie ọnu n'oge ebighi-ebi, 26 ma ub͕u a ka emere ka ọ puta ìhè, esite kwa n'ihe ndi-amuma deworo n'akwukwọ me ka mba nile mara ya, dika ihe Chineke ebighi-ebi nyere n'iwu si di, rue iṅa-nti nke okwukwe; 27 Chineke Nke nání Ya bu Onye-amam-ihe, site n'aka Jisus Kraist, Onye otuto diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.

1 Kọrint 1

1 Pọl, onye akpọrọ ibu onye-ozi nke Jisus Kraist site n'ọchichọ nke Chineke, na Sostenis nwa-nna-ayi, 2 nēdegara nzukọ Chineke nke di na Kọrint akwukwọ, bú ndi edoworo nsọ nime Kraist Jisus, ndi akpọrọ ibu ndi nsọ, ha na ndi nile nākpọku aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist n'ebe nile, bú Onye-nwe ayi na ha: 3 Amara diri unu na udo nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist puta. 4 Anamekelere unu Chinekem mb͕e nile, n'ihi amara nke Chineke nke enyere unu nime Kraist Jisus; 5 na n'ihe nile ọ bula emere unu ndi-ọgaranya nime Ya, n'okwu nile na ọmuma nile; 6 dika emere ka àmà nke Kraist guzosie ike nime unu: 7 nke mere na ọ dighi onyinye-amara fọduru nke unu nēnweghi; unu nēche kwa nkpughe Onye-nwe-ayi Jisus Kraist; 8 Onye gēme kwa ka unu guzosie ike rue ọgwugwu ihe nile, buru ndi anāpughi ibo ebubo n'ubọchi Onye-nwe-ayi Jisus Kraist. 9 Chineke kwesiri ntukwasi-obi, Onye esitere n'aka Ya kpọbata unu na nnwekọ nke Ọkpara-Ya Jisus Kraist Onye-nwe-ayi. 10 Ma, umu-nnam, esiterem n'aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist riọ unu, ka unu nile nēkwu otù ihe, ka nkewa ghara kwa idi n'etiti unu; kama ka eme unu ka unu zue okè n'otù uche ahu na n'otù ìzù ahu. 11 N'ihi na ndi èzí-na-ulo Kloi gosirim ihe bayere unu, umu-nnam, na esem-okwu di n'etiti unu. 12 Ihe m'nēkwu bu nka, na unu nile n'otù n'otù nāsi, Mu onwem bu nke Pọl; mu onwem bu kwa nke Apọlos; mu onwem bu kwa nke Kifas; mu onwem bu kwa nke Kraist. 13 Èkèwo Kraist èkè? ọ̀ gābu na akpọgidere Pọl n'obe n'ihi unu? mà-ọbu na emere unu baptism ibà n'aha Pọl? 14 Anamekele Chineke na ọ dighi onye ọ bula n'etiti unu m'mere baptism, ma-ọbughi Krispọs na Gaiọs; 15 ka onye ọ bula ghara isi na emere unu baptism ibà n'aha nkem. 16 Ma eme-kwa-ram èzí-na-ulo Stefanas baptism: ma ewepu ndia, amataghm ma emerem onye ọ bula ọzọ baptism. 17 N'ihi na Kraist eziteghm ime baptism, kama izisa ozi ọma: ọ bughi n'amam-ihe nke okwu, ka aghara ime ka obe Kraist buru ihe-efu. 18 N'ihi na okwu nke obe buru ndi nāla n'iyì ihe-nzuzu; ma ọ buru ayi, bú ndi anāzọputa, ike nke Chineke. 19 N'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, M'gāla amam-ihe nke ndi mara ihe n'iyì, M'gāju kwa nghọta nke ndi nwere nghọta. 20 Òle ebe onye mara ihe nọ? òle ebe ode-akwukwọ nọ? òle ebe onye oge a, onye ya na ibe-ya nājurita ajuju, nọ? Chìneke emeghi ka amam-ihe uwa buru ihe-nzuzu? 21 N'ihi na ebe uwa n'amam-ihe nke Chineke nējighi amam-ihe-ya mara Chineke, ọ di Chineke ezi nma iji ihe-nzuzu nke ihe ahu anēkwusa izọputa ndi kwere. 22 Ebe ndi-Ju nāriọ ihe-iriba-ama di iche iche, ndi-Grik nāchọ kwa amam-ihe: 23 ma ayi onwe-ayi nēkwusa Kraist, na akpọgidere Ya n'obe, Onye buru ndi-Ju ọnyà, buru kwa ndi mba ọzọ ihe-nzuzu; 24 ma Ọ buru ndi akpọrọ, ma ndi-Ju ma ndi-Grik, Kraist, bú ike nke Chineke, na amam-ihe nke Chineke. 25 N'ihi na ihe-nzuzu nke Chineke kariri madu nile n'amam-ihe; adighi-ike nke Chineke kariri kwa madu nile n'ike. 26 N'ihi na lenu ọkpukpọ-unu, umu-nnam, na ọ dighi ọtutu ndi mara ihe dika anu-aru si mara ihe, ọ dighi ọtutu ndi-ike, ọ dighi ọtutu ndi amazuru aha-ha, ka akpọrọ: 27 Kama ọ bu ihe-nzuzu nke uwa ka Chineke rọputara, ka O we me ka ihere me ndi mara ihe; ọ bu kwa ihe nādighi ike nke uwa ka Chineke rọputara, ka O we me ka ihere me ihe di ike; 28 ọ bu kwa ihe di ala nke uwa, na ihe akpọrọ ihe-efu, ka Chineke rọputara, bú ihe nke nādighi, ka O we me ka ihe nke nādi ghara idi irè: 29 ka anu-aru nile, bú madu, we ghara inya isi n'iru Chineke. 30 Ma unu onwe-unu sitere na Ya di nime Kraist Jisus, Onye ghọrọ amam-ihe nye ayi site na Chineke, bú ezi omume, na ido-nsọ kwa, na nb͕aputa: 31 ka, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, Onye nānya isi, ya nya n'Onye-nwe-ayi.

1 Kọrint 2

1 Mu onwem kwa, umu-nnam, mb͕e m'biakutere unu, abiaghm n'ọ̀kà okwu ma-ọbu n'ọ̀kà amam-ihe, nēkwusara unu àmà nke Chineke. 2 N'ihi na ezuberem ka m'ghara imata ihe ọ bula n'etiti unu, ma-ọbughi Jisus Kraist, ka m'mata kwa Onye ahu ka onye akpọgideworo n'obe. 3 Mu onwem nọ kwa n'etiti unu n'adighi-ike, na n'egwu, na n'oké ima-jijiji. 4 Okwum na ihe m'kwusara abughi kwa n'okwu amam-ihe, ime ka madu kweye, kama ha bu na ngosi nke Mọ Nsọ na nke ike: 5 ka okwukwe-unu we ghara idi n'amam-ihe madu, kama n'ike nke Chineke. 6 Otú ọ di, amam-ihe bu ihe ayi nēkwu n'etiti ndi tozuru okè: ma ọ bu amam-ihe nke nābughi nke oge a, ọ bughi kwa nke ndi-isi oge a, ndi anēme ka ha ghara idi irè: 7 kama ihe ayi nēkwu bu amam-ihe Chineke n'ihe-omimi, bú amam-ihe nke ezobeworo, nke Chineke buru uzọ ka àkà mb͕e oge ndia akērughi, iwetara ayi otuto: 8 nke ọ dighi onye ọ bula n'etiti ndi-isi oge a mara: n'ihi na asi na ha mara ya-ri, ha agaghi-akpọgidewori Onye-nwe ebube n'obe: 9 kama dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ihe anya nāhughi, nke nti nānughi kwa, Nke nābàghi kwa n'obi madu, Ka ha ra, bú ihe Chineke doziri ndi huru Ya n'anya. 10 Ma ọ bu ayi onwe-ayi ka Chineke kpughere ha site n'aka Mọ Nsọ: n'ihi na Mọ Nsọ nēnyocha ihe nile, ọbuná ihe nile di omimi nke Chineke. 11 N'ihi na ònye n'etiti madu matara ihe nile nke madu, ma-ọbughi mọ nke madu ahu, nke di nime ya? ọbuná otú a ọ dighi onye mara ihe nke Chineke, ma-ọbughi Mọ nke Chineke. 12 Ma ayi onwe-ayi anataghi mọ nke uwa, kama ọ bu Mọ Nke sitere na Chineke; ka ayi we mata ihe nile Chineke were amara nye ayi. 13 Ọ bu kwa ihe ndia ka ayi nēkwu, ọ bughi n'okwu nke amam-ihe madu nēzí, kama n'okwu nke Mọ Nsọ nēzí; ayi nēwere kwa ihe nke Mọ Nsọ tule ihe nke Mọ Nsọ. 14 Ma madu nke nkpuru-obi onwe-ya nāchi adighi-anata ihe nke Mọ nke Chineke: n'ihi na ha bu ihe-nzuzu n'anya-ya; ọ pughi kwa imara ha, n'ihi na ewere Mọ Nsọ sikwuputa ha. 15 Ma onye Mọ Nsọ nāchi nēsikwuputa ihe nile, ma ọ dighi onye ọ bula nēsikwuputa ya onwe-ya. 16 N'ihi na ònye mara uche Onye-nwe-ayi, ka o zí Ya ihe? Ma ayi onwe-ayi nwere uche nke Kraist.

1 Kọrint 3

1 Mu onwem kwa, umu-nnam, apughi m igwa unu okwu dika ndi Mọ Nsọ nāchi, kama dika ndi bu nání anu-aru, dika umu ọhu nime Kraist. 2 Ejirim ara zù unu, ọ bughi ihe-oriri; n'ihi na unu akāpughi inagide ya; é-è, ọbuná ub͕u a unu apughi; 3 n'ihi na unu bu ndi anu-aru nāchi rue ub͕u a: n'ihi na ebe ekworo na esem-okwu di n'etiti unu, ùnu abughi ndi anu-aru nāchi, ndi nējeghari kwa dika madu? 4 N'ihi na mb͕e ọ bula otù onye nāsi, Mu onwem bu nke Pọl; mb͕e ibe-ya nāsi kwa, Mu onwem bu nke Apọlos; ùnu abughi madu efu? 5 Gini kwa bu Apọlos? gini bu kwa Pọl? Ndi nēje ozi, ndi unu si n'aka-ha kwere; dika Onye-nwe-ayi nye-kwa-ra ha abua n'otù n'otù. 6 Mu onwem kuru osisi, Apọlos kwọsara ya miri; ma ọ bu Chineke nēme ka ọ nāba uba. 7 Ya mere onye nāku abughi ihe ọ bula, onye nākwọsa miri abughi kwa ihe ọ bula; kama Chineke, Onye nēme ka ọ nāba uba, bu ihe nile. 8 Ma onye nāku na onye nākwọsa miri bu otù: ma ha abua n'otù n'otù gānata ugwọ-ọlu nke aka ha, onye ọ bula dika ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu si di. 9 N'ihi na ayi bu ndi ha na Chineke nālukọ ọlu: unu bu ubi Chineke, buru kwa ulo Chineke nēwu. 10 Dika amara Chineke nke enyerem si di, dika onye-isi-ọ̀kà nke mara ihe, atọrọm ntọ-ala; onye ọzọ nēwu kwa ulo n'elu ya. Ma ka onye ọ bula lezi anya otú ọ nēwu ulo n'elu ya. 11 N'ihi na ọ dighi onye ọ bula puru itọ ntọ-ala ọzọ ma-ọbughi Nke atọworo, Nke bu Jisus Kraist. 12 Ma ọ buru na onye ọ bula ewukwasi ọla-edo, ọla-ọcha, nkume di oké ọnu, osisi, ahihia, okporo-ọka, n'elu ntọ-ala ahu; 13 agēme ka ọlu nke madu nile n'otù n'otù puta ìhè: n'ihi na ubọchi ahu gēgosi ya, n'ihi na agaje ikpughe ya n'ọku; ọku onwe-ya gānwa kwa ọlu madu nile n'otù n'otù, aha ọlu ọ bu. 14 Ọ buru na ọlu onye ọ bula gādigide nke o wukwasiri ya, ọ gānata ugwọ-ọlu. 15 Ọ buru na agērechapu ọlu onye ọ bula n'ọku, ọ gēyi iyì: ma agāzọputa ya onwe-ya; ma ọ bu dika onye azọputara n'ọku. 16 Ùnu amataghi na unu bu ulo nsọ Chineke, Mọ nke Chineke bi kwa nime unu? 17 Ọ buru na onye ọ bula emebi ulo nsọ Chineke, onye ahu ka Chineke gēmebi; n'ihi na ulo nsọ Chineke di nsọ, otú a ka unu di kwa. 18 Ka onye ọ bula ghara ighọb͕u onwe-ya. Ọ buru na onye ọ bula nēchè na ya bu onye mara ihe n'etiti unu n'oge a, ya ghọ onye-nzuzu, ka o we ghọ onye mara ihe. 19 N'ihi na amam-ihe nke uwa nka bu ihe-nzuzu n'ebe Chineke nọ. N'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye nējide ndi mara ihe n'aghughọ-ha: 20 ọzọ kwa, Onye-nwe-ayi mara ihe ndi mara ihe nātule n'obi-ha, na ha bu ihe-efu. 21 Ya mere onye ọ bula anyala isi na madu. N'ihi na ihe nile bu nke unu; 22 ma ọ bu Pọl, ma-ọbu Apọlos, ma-ọbu Kifas, ma-ọbu uwa, ma-ọbu ndu ma-ọbu ọnwu, ma-ọbu ihe di ub͕u a, ma-ọbu ihe gaje idi; ihe nile bu nke unu; 23 ma unu onwe-unu bu ndi nke Kraist; ma Kraist bu nke Chineke.

1 Kọrint 4

1 Ka madu nāgu ayi otú a, dika ndi nējere Kraist ozi, ndi bu kwa ndi nāchi èzí-na-ulo n'ihe-omimi nke Chineke. 2 N'ebe a ihe anāchọ kwa n'aka ndi nāchi èzí-na-ulo bu, ka ahu onye ọ bula na o kwesiri ntukwasi-obi. 3 Ma ọ burum ihe dikarisiri ntà ka unu, ma-ọbu ubọchi ikpé nke madu, kpem ikpé: é-è, ekpeghi m ọbuná onwem ikpé. 4 N'ihi na ọ dighi ihe ọ bula m'mara megide onwem; ma ọ bughi na nka ka aguworom n'onye ezi omume: kama Onye nēkpem ikpé bu Onye-nwe-ayi. 5 Ya mere, unu ekpela ihe ọ bula ikpé mb͕e oge ahu akērughi, rue mb͕e ọ bula Onye-nwe-ayi gābia, Onye gēweputa kwa ihe nile ezoro ezo nke ọchichiri n'ìhè, me kwa ka ìzù nile nke obi nile puta ìhè; mb͕e ahu ka madu nile n'otù n'otù gēnwe kwa otuto-ha site n'aka Chineke. 6 Ma ihe ndia, umu-nnam, ka m'mere ka ha ghọ mu onwem na Apọlos n'oyiyi n'ihi unu; ka unu we muta nime ayi ozizì a, Unu agabigala ihe edeworo n'akwukwọ, ka unu we ghara ifuli onwe-unu elu, otù onye n'ihi otù onye megide madu-ibe-ya. 7 N'ihi na Ònye nākpa ókè n'etiti gi na madu-ibe-gi? ọ̀ bu gini kwa ka i nwere nke i nānataghi? ma ọ buru na i natara ya, gini mere i nānya isi, dika agāsi na i nataghi ya? 8 Ọbuná ub͕u a unu erijuwo afọ, ọbuná ub͕u a unu ghọrọ ọgaranya, unu buru eze mb͕e ayi onwe-ayi nānọghi ya: e, ọ gādim nọ̄ mma, ma asi na unu buru eze n'ezie, ka ayi onwe-ayi we so kwa unu buru eze. 9 N'ihi na anamechè na Chineke were ayi, bú ndi-ozi, gosi, dika ndi-ikpe-azu, dika ndi amara ikpé ọnwu: n'ihi na emere ayi ihe-nkiri nye uwa na ndi-mọ-ozi na madu. 10 Ayi onwe-ayi bu ndi-nzuzu n'ihi Kraist, ma unu onwe-unu bu ndi nwere uche nime Kraist; ayi onwe-ayi adighi ike, ma unu onwe-unu di ike; anēnye unu onwe-unu otuto, ma anēme ayi onwe-ayi ihe-ihere. 11 We rue oge hour di ub͕u a agu nāgu ayi, akpiri nākpọ kwa ayi nku, ayi nāb͕a kwa ọtọ, anēti kwa ayi aka, ayi enweghi kwa ebe-obibi; 12 ayi nādọb͕u kwa onwe-ayi n'ọlu, were aka-ayi nālu ọlu: mb͕e anēkwutọ ayi, ayi nāgọzi: mb͕e anēsob͕u ayi, ayi nānagide: 13 mb͕e anēkwulu ayi, ayi nāriọ aririọ; emere ka ayi buru dika ihe asachapuru n'uwa, ihe ehichapuru n'ihe nile, rue ub͕u a. 14 Edeghi m ihe ndia n'akwukwọ dika anameme unu ihe-ihere n'iru, kama dika anamadu unu ọdú, dika umum m'huru n'anya. 15 N'ihi na asi na unu nwere orú nnù ndi-ozizí na nnù ndi-ozizí ise nime Kraist, ma unu enweghi ọtutu nna: n'ihi na mu onwem nime Kraist Jisus were ozi ọma mu unu. 16 Ya mere ariọm unu, burunu ndi nēṅomim. 17 N'ihi nka ka m'zitere unu Timọti, onye bu nwam nime Onye-nwe-ayi, buru kwa onye m'huru n'anya, onye kwesiri ntukwasi-obi, ọ gēchetara unu uzọm nile nke di nime Kraist, dika m'nēzí n'ebe nile na nzukọ Kraist nile ọ bula. 18 Ma ufọdu fuliri onwe-ha elu, dika agāsi na m'gaghi-abiakute unu. 19 Ma m'gābiakute unu ọsọsọ, ma ọ buru na Onye-nwe-ayi chọrọ; m'gāmara kwa, ọ bughi okwu nke ndi fuliworo onwe-ha, kama ike-ha. 20 N'ihi na ala-eze Chineke adighi n'okwu-ọnu, kama n'ike. 21 Gini ka unu nāchọ? ọ̀ bu utari ka m'gēwere biakute unu, ma-ọbu ihu-n'anya na mọ nke idi-nwayọ?

1 Kọrint 5

1 Anānu nọ̄ na ikwa-iko di n'etiti unu, aha ikwa-iko nke nādighi kwa ọbuná n'etiti ndi mba ọzọ, nke mere na otú onye n'etiti unu nwere nwunye nna-ya. 2 Unu onwe-unu afuliwo kwa onwe-unu elu, unu erughi kwa újú kama nke ahu, ka ewe wepu onye ahu n'etiti unu, bú onye luru ọlu a. 3 N'ihi na mu onwem n'ezie, ebe m'nānọghi n'etiti unu n'arum, ma anọm n'etiti unu na mọm, ekpewom onye ahu nke lutara nka otú a ikpé ọbuná ub͕u a, dika agāsi na anọm, 4 n'aha nke Onye-nwe-ayi Jisus, mb͕e unu zukọrọ, mọm nēso kwa unu, ya na ike nke Onye-nwe-ayi Jisus, 5 irara onye di otú a nye n'aka Setan ibibi anu-aru-ya, ka ewe zọputa mọ-ya n'ubọchi Onye-nwe-ayi Jisus. 6 Ihe-inya-isi-unu adighi nma. Ùnu amataghi na ihe-iko-achicha di ntà nēko ob͕e utu ọka agwọrọ agwọ dum? 7 Sachapunu ihe-iko-achicha ochie, ka unu we buru ob͕e utu ọka agwọrọ agwọ ọhu, dika unu bu achicha ekoghi-eko. N'ihi na achu-kwa-ra àjà-ngabiga-ayi, bú Kraist: 8 ya mere, ka ayi nēme ememe ahu, ọ bughi n'ihe-iko-achicha ochie, ọ bughi kwa n'ihe-iko-achicha nke bu obi ọjọ na ajọ ọlu, kama n'achicha ekoghi-eko nke bu idi-ọcha na ezi-okwu. 9 Edegaram unu n'akwukwọ-ozim ka unu na ndi nākwa iko ghara imekọ ihe; 10 ọ bughi ndi nke uwa nka ndi nākwa iko ma-ọli, ma-ọbu ndi-anya-uku-ya na ndi nāpunara madu ihe, ma-ọbu ndi nēkpere arusi: ebe ọ gādi unu nkpà isi n'uwa pua ma asi na unu eme otú a: 11 ma otú ọ di, edegaram unu ka unu na onye ọ bula nke anākpọ ya aha na ọ bu nwa-nna ghara imekọ ihe, ma ọ buru na onye ahu bu onye nākwa iko, ma-ọbu onye-anya-uku, ma-ọbu onye nēkpere arusi, ma-ọbu onye-nkwutọ, ma-ọbu onye nāṅubiga manya ókè, ma-ọbu onye nāpunara madu ihe; ka unu na onye di otú a ghara ọbuná irikọ ihe. 12 N'ihi na òle ihe bu nkem ikpe ndi nọ n'èzí ikpé? Ọ̀ bughi ndi nọ n'ime ka unu onwe-unu nēkpe? 13 ma Chineke nēkpe ndi nọ n'èzí ikpé. Wepunu ajọ onye ahu n'etiti onwe-unu.

1 Kọrint 6

1 Ọ̀ di onye ọ bula n'etiti unu, ma asi na o nwere okwu megide ibe-ya, nwere anya-ike ije ikpé n'iru ndi ajọ omume, ma ọ bughi n'iru ndi nsọ? 2 Ma-ọbu ùnu amataghi na ndi nsọ gēkpe uwa ikpé? ọ buru kwa na agaje ikpe uwa n'iru unu, ùnu ekwesighi inọ dika ndi-ikpé n'ulo-ikpé dikarisiri ntà? 3 Ùnu amataghi na ayi gēkpe ndi-mọ-ozi ikpé? àyi gēsi aṅa ghara inwe ike ikpe ihe nke ndu a? 4 Ya mere asi na unu nwere ulo-ikpé diri ndu a n'ezie, menu ka ndi ahu nọdu dika ndi-ikpé, bú ndi anākpọ ihe-efu n'etiti nzukọ Kraist. 5 Anamekwu nka ka m'me unu ihe-ihere n'iru. Ọ̀ di otú a, na ọ dighi otù onye mara ihe nọ n'etiti unu, onye gāpu ikpe ikpé n'etiti nwa-nna-ya na ibe-ya, 6 kama nwa-nna nēwere nwa-nna-ya je ikpé, nka bu kwa n'iru ndi nēkweghi ekwe? 7 Ezie ọ bu nọ̄ ila-ala n'ebe unu nọ ọbuná ub͕u a, na unu nwere okwu ikpé n'etiti onwe-unu. Kari nke ahu, n'ìhi gini unu adighi-ekwe ka emegide unu ajọ omume? kari nke ahu, n'ìhi gini unu adighi-ekwe ka emeb͕ue unu? 8 É-è, kama unu onwe-unu nēme ajọ omume, nēmeb͕u kwa, nka ka unu nēme kwa umu-nna-unu. 9 Ma-ọbu ùnu amataghi na ndi ajọ omume agaghi-eketa ala-eze Chineke? Unu ekwela ka eduhie unu: ndi nākwa iko, ma-ọbu ndi nēkpere arusi, ma-ọbu ndikom nākwa iko, bú ndi nwere nwunye, ma-ọbu ndikom nēme dika ndinyom, ma-ọbu ndikom nēmeru onwe-ha n'aru ndikom, 10 ma-ọbu ndi-ori, ma-ọbu ndi-anya-uku, ma-ọbu ndi nāṅubiga manya ókè, ma-ọbu ndi-nkwutọ, ma-ọbu ndi nāpunara madu ihe, ha agaghi-eketa ala-eze Chineke. 11 Otú a ka ufọdu n'etiti unu di-kwa-ri: ma unu sachara onwe-unu, ma edoro unu nsọ, ma aguru unu na ndi ezi omume n'aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ya na nime Mọ nke Chineke-ayi. 12 Ihe nile zirim ezi n'iwu; ma ọ bughi ihe nile nābaram urù. Ihe nile zirim ezi n'iwu; ma ọ dighi ihe ọ bula gāchi mu onwem. 13 Ihe-oriri nile diri afọ, afọ di-kwa-ra ihe-oriri nile: ma Chineke gēme ka ya na ha ghara idi irè. Ma aru-ayi adirighi ikwa-iko, kama ọ diri Onye-nwe-ayi; Onye-nwe-ayi di-kwa-ra aru-ayi: 14 ma Chineke mere ka Onye-nwe-ayi si n'ọnwu bilie, Ọ gēsite kwa n'ike-Ya me ka ayi onwe-ayi si n'ọnwu bilie. 15 Ùnu amataghi na aru-unu bu ihe di n'aru Kraist? #m'gēwepu kwa ihe di n'aru Kraist, me ha ka ha buru ihe di n'aru nwanyi nākwa iko? Chineke ekwela. 16 Ma-ọbu ùnu amataghi na onye nārapara n'aru nwanyi nke nākwa iko, ya na ya bu otù aru? n'ihi na, Ha abua ka O kwuru, gāghọ otù anu-aru. 17 Ma onye nārapara n'aru Onye-nwe-ayi, ya na Ya bu otù mọ. 18 B͕anarinu ikwa-iko. Nmehie nile ọ bula nke madu nēme di n'elu aru; ma onye nākwa iko nēmehie megide aru nke onwe-ya. 19 Ma-ọbu ùnu amataghi na aru-unu bu ulo nsọ nke Mọ Nsọ, Onye bi nime unu, Onye unu nwere site na Chineke? ọ bughi kwa unu onwe-unu nwe onwe-unu; 20 n'ihi na ewere ọnu-ahia b͕ara unu: ya mere nyenu Chineke otuto n'aru-unu.

1 Kọrint 7

1 Ma okwu bayere ihe unu dere akwukwọ bayere ha: Ọ di nma ka nwoke ghara imetu nwanyi aka. 2 Ma, n'ihi ikwa-iko nile, ka nwoke ọ bula nwe nwunye nke aka ya, ka nwanyi ọ bula nwe kwa di nke aka ya. 3 Ka di kwughachi nwunye-ya ugwọ o ji ya: otú a kwa ka nwunye kwughachi kwa di-ya ugwọ o ji ya. 4 Ọ bughi nwunye nāchi aru nke onwe-ya, kama ọ bu di-ya: otú a kwa ọ bughi di nāchi kwa aru nke onwe-ya, kama ọ bu nwunye-ya. 5 Unu emeb͕ula onwe-unu, ma-ọbughi ma eleghi anya unu gēsite n'inwe otù olu me ya na nwa oge, ka unu we nwe oghere ikpe ekpere, we nọkọ kwa ọzọ, ka Setan we ghara inwa unu n'ihi na unu apughi ijide onwe-unu. 6 Ma anamekwu nka n'uzọ nkweye, ọ bughi n'uzọ ihe enyere n'iwu. 7 Ma anamachọ ka madu nile di ka mu onwem di kwa. Otú ọ di, madu nile n'otù n'otù nwere onyinye-amara nke aka ha site na Chineke, otù onye otú a, onye ọzọ otú a kwa. 8 Ma asim ndi nānọghi n'ọnọdu di na nwunye na ndi di-ha nwuru, Ọ diri ha nma ma asi na ha nānọgide dika mu onwem nọ kwa. 9 Ma ọ buru na ha apughi ijide onwe-ha, ka ha luru: n'ihi na ilu di na nwunye ka ire ọku n'agu aru nma. 10 Ma enyem ndi nọ n'ọnọdu di na nwunye iwu, ọ bughi mu onwem, kama ọ bu Onye-nwe-ayi, Ka nwunye ghara ikewapu onwe-ya n'aru di-ya 11 (ma asi na ọ bu ezie na ọ kewapuru onwe-ya, ya nọgide nēnweghi di; ma ọ meghi otú a, ka eme ka ya na di-ya di n'otù); ka di ghara kwa irapu nwunye-ya. 12 Ma ọ bu mu onwem, ọ bughi Onye-nwe-ayi, nāsi ndi fọduru: Ọ buru na nwa-nna ọ bula nwere nwunye nēkweghi ekwe, ọ buru kwa na ọ di nwanyi ahu ezi nma ka ya na ya biri, ka di-ya ghara irapu ya. 13 Ọzọ, nwanyi nke nwe di nēkweghi ekwe, ọ buru kwa na ọ di nwoke ahu ezi nma ka ya na ya biri, ka ọ ghara irapu di-ya. 14 N'ihi na edowo di nēkweghi ekwe nsọ nime nwunye-ya, edowo kwa nwunye nēkweghi ekwe nsọ nime nwa-nna-ayi nwoke: n'ihi na, ma ọ dighi otú a, umu-unu gābu umu nādighi ọcha; ma otú ọ di, ha di nsọ. 15 Ma ọ buru na onye ahu nke nēkweghi ekwe ekewapu onwe-ya, ya kewapu onwe-ya: emeghi ka nwa-nna-ayi nwoke ma-ọbu nwa-nna-ayi nwanyi buru orù n'okwu di otú a: ma Chineke akpọwo ayi n'udo. 16 N'ihi na ì si aṅa mara, nwunye, ma i gāzọputa di-gi? ma-ọbu ì si aṅa mara, di, ma i gāzọputa nwunye-gi. 17 Ọ bu nání, dika Onye-nwe-ayi kèworo nye onye ọ bula, dika Chineke kpọworo onye ọ bula, ya jegharia otú a. Otú a ka m'nāka kwa àkà nime nzukọ Kraist nile. 18 Àkpọrọ onye ọ bula mb͕e ebìsiri ya úgwù? ya ghara ighọ onye anēbìghi úgwù. Àkpọworo onye ọ bula n'ebìghi-úgwù? ya ghara ikwe ka ebì ya úgwù. 19 Obibì-úgwù abughi ihe, ebìghi-úgwù abughi kwa ihe; kama ọ bu idebe ihe nile Chineke nyere n'iwu. 20 Onye ọ bula, nime ọkpukpọ ahu eji kpọ ya, ya nọgide n'ọkpukpọ ahu. 21 Àkpọrọ gi mb͕e i bu orù? ya eb͕ula gi nb͕u n'obi: ma ọ buru kwa na i puru inwe onwe-gi, kari nke ahu were ya me ihe. 22 N'ihi na onye akpọrọ nime Onye-nwe-ayi, mb͕e ọ bu orù, ọ bu onye Onye-nwe-ayi mere ka o nwere onwe-ya: otú a onye akpọrọ, mb͕e o nwere onwe-ya, ọ bu orù Kraist. 23 Ewere ọnu-ahia b͕ara unu; unu aghọla ndi-orù madu. 24 Umu-nnam, onye ọ bula, nime ọnọdu nke akpọrọ ya, ya nọgide n'ọnọdu ahu n'ebe Chineke nọ. 25 Ma enweghi m ihe Onye-nwe-ayi nyere n'iwu bayere umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke: ma enyem ìzùm, dika onye Onye-nwe-ayi meworo ebere ka m'buru onye kwesiri ntukwasi-obi. 26 Ya mere, anamechè na nka di nma n'ihi nkpà di ub͕u a, bù, na ọ di nma ka madu di otú ọ di. 27 Ékekọwo gi na nwunye? achọla ntọpu. Àtọpuwo gi n'aru nwunye? achọla nwunye. 28 Ma asi kwa na ọ bu ezie na i luru nwunye, i mehieghi; asi kwa na nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke lakuru di, o mehieghi. Otú ọ di, ndi di otú a gēnwe nkpab͕u n'anu-aru-ha: ma mu onwem nēmere unu ebere. 29 Ma nka ka m'nēkwu, umu-nnam, emewo ka oge a di nkpunkpu, ka ndi nwere nwunye we di ka ha enweghi site n'ub͕u a; 30 ka ndi nākwa ákwá we di ka ha akwaghi; ka ndi nāṅuri ọṅu we di ka ha aṅurighi; ka ndi nāzu ahia we di ka ha enweghi ihe; 31 ka ndi nēji uwa me ihe we di ka ha ejibigaghi ya ókè: n'ihi na uwa nka ka esi ahu ya anya nāgabiga agabiga. 32 Ma anamachọ ka unu buru ndi nādighi-echeb͕u onwe-unu. Onye nēnweghi nwunye nēcheb͕u onwe-ya n'ihe nke Onye-nwe-ayi, otú ọ gēme ihe gātọ Onye-nwe-ayi utọ: 33 ma onye nwere nwunye nēcheb͕u onwe-ya n'ihe uwa, otú ọ gēme ihe gātọ nwunye-ya utọ. 34 Akpawo kwa ókè n'etiti nwunye na nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke. Nwanyi nke nēnweghi di nēcheb͕u onwe-ya n'ihe nke Onye-nwe-ayi, ka o we di nsọ n'aru-ya na mọ-ya kwa: ma nwanyi nke nwere di nēcheb͕u onwe-ya n'ihe nke uwa, otú ọ gēme ihe gātọ di-ya utọ. 35 Ma nka ka m'nēkwu ka ọ bara unu onwe-unu urù; ọ bughi ka m'fekwasi ihe-ntuhi n'aru-unu, kama ka eme ihe kwesiri, ya na ka unu we nọdu n'iru Onye-nwe-ayi ghara inwe uche-nb͕asasi. 36 Ma ọ buru na onye ọ bula nēchè na ọ nēmeso nwa-ya, bú nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, ihe nādighi nma n'anya, ma asi na ọ gabigawo oge inwe di, asi kwa na ọ di nkpà ime otú a, ya me ihe ọ nāchọ; o mehieghi; ka ha lua di na nwunye. 37 Ma onye nēguzosi ike n'obi-ya, ebe nkpà nākpaghi ya, kama o nwere ike ime ihe ya onwe-ya nāchọ, o zubewo kwa nka n'obi nke onwe-ya, idebe nwa-ya, bú nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, ọ gēme nke-ọma. 38 Ya mere onye nēnye nwa-ya n'ọlulu-di, bú nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, nēme nke-ọma; onye nēnyeghi ya n'ọlulu-di gēme kwa nke-ọma kari. 39 Ekewo nwunye n'aru di-ya ka oge di-ya nọ na ndu ra; ma asi na di-ya adawo n'ura ọnwu, o nwere onwe-ya ilu di ọ nāchọ; ma ọ bu nání nime Onye-nwe-ayi. 40 Ma ngọzi dikariri ya ma asi na ọ nọgidere otú ọ di, dika ìzùm si di: ma anamechè na mu onwem nwe-kwa-ra Mọ Chineke.

1 Kọrint 8

1 Ma okwu bayere ihe achuru n'àjà nye arusi: Ayi matara na ayi nile nwere ọmuma-ihe. Ọmuma-ihe nāfuli elu, ma ihu-n'anya nēwuli elu dika ulo. 2 Ọ buru na onye ọ bula nēchè na ya mara ihe ọ bula, ọ kāmaghi dika ọ nāghaghi ima; 3 ma ọ buru na onye ọ bula nāhu Chineke n'anya, onye ahu ka Chineke mara. 4 Ya mere okwu bayere iri ihe achuru n'àjà nye arusi, ayi matara na ọ dighi arusi ọ bula bu ihe n'uwa, ayi mata-kwa-ra na ọ dighi Chineke ọzọ ma-ọbughi otù. 5 N'ihi na asi na ọ bu kwa ezie na ndi anākpọ chi di, ma ọ bu n'elu-igwe ma-ọbu n'elu uwa; dika ọtutu chi na ọtutu ndi-nwe-madu di; 6 ma n'ebe ayi nọ otù Chineke di, bú Nna, Onye ihe nile sitere na Ya, Onye ayi onwe-ayi di-kwa-ra Ya; otù Onye-nwe-ayi di kwa, bú Jisus Kraist, Onye ihe nile sitere n'aka-Ya, ayi onwe-ayi site-kwa-ra n'aka-Ya. 7 Otú ọ di ọ bughi nime madu nile ka ọmuma-ihe ahu di: kama ufọdu, ebe arusi bu ihe anēme n'ala-ha rue ub͕u a, ha nēri ihe ahu dika ihe achuru n'àjà nye arusi; anēmeru kwa akọ-na-uche-ha, ebe ọ nādighi ike. 8 Ma ihe-oriri agaghi-eche ayi n'iru Chineke: ma asi na ayi erighi, ọ dighi ihe fọduru ayi inwe; ma asi kwa na ayi nēri, ayi ababigaghi ókè. 9 Ma lezienu anya ka ike-unu nka ghara isi n'uzọ ọ bula ghọ ihe gēme ka ndi nādighi ike su ngọngọ. 10 N'ihi na asi na onye ọ bula ahú gi, bú onye nwere ihe-ọmuma, ka i nānọdu na nri nime ulo arusi, akọ-na-uche-ya, ma ọ buru na ọ dighi ike, àgaghi-ewuli ya elu dika ulo iri ihe achuru n'àjà nye arusi? 11 N'ihi na site n'ihe-ọmuma-gi onye ahu nke nādighi ike nāla n'iyì, bú nwa-nna-gi nke Kraist nwuru n'ihi ya. 12 Ma otú a, mb͕e unu nēmehie megide umu-nna-unu, nētib͕u kwa akọ-na-uche-ha mb͕e ọ nādighi ike, unu nēmehie megide Kraist. 13 N'ihi nka, ma ọ buru na ihe-oriri eme ka nwa-nnam ma n'ọnyà, m'gaghi-eri anu ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi, ka m'ghara ime ka nwa-nnam ma n'ọnyà.

1 Kọrint 9

1 Ènweghi m onwem? àbughi m onye-ozi? àhughm Jisus Onye-nwe-ayi? ùnu onwe-unu abughi ọlum nime Onye-nwe-ayi? 2 Ọ buru na abughm onye-ozi n'ebe ndi ọzọ nọ, ma otú ọ di, abum onye-ozi n'ebe unu nọ: n'ihi na akàrà nke ọlu onye-ozi nkem ka unu onwe-unu bu nime Onye-nwe-ayi. 3 Ngọpum n'iru ndi nēkpem ikpé bu nka. 4 Ọ̀ gābu na ayi enweghi ike iri ihe na iṅu ihe? 5 Ọ̀ gābu na ayi enweghi ike ikuru nwunye, bú nwa-nna-nwanyi nime Kraist, jeghari, dika ndi-ozi fọduru nēme kwa, ha na umu-nne Onye-nwe-ayi, na Kifas? 6 Ma-ọbu nání mu onwem na Banabas, àyi enweghi ike ighara ilu ọlu? 7 Òle onye-agha nēwere ego-ọlu nke aka ya lua ọlu onye-agha mb͕e ọ bula? ònye nāku ubi-vine, nādighi-eri kwa nkpuru-ya? ma-ọbu ònye nāzù ìgwè aturu, nādighi-eri kwa ihe putara na miri-ara ìgwè aturu ahu? 8 Ọ̀ gabu na anamekwu ihe ndia dika madu si ekwu? ma-ọbu ìwu Chineke adighi-ekwu kwa ihe ndia? 9 N'ihi na edewo ya n'iwu Moses, si, Ekechila ọnu ehi mb͕e ọ nāzọcha ọka. Ọ̀ gābu na ehi bu ihe nēmetu Chineke n'obi? 10 ma-ọbu Ò nēkwu ya n'ihi ayi onwe-ayi? E, n'ihi ayi ka edere ya n'akwukwọ nsọ: n'ihi na onye nālu ọlu ubi kwesiri ilu ọlu ubi n'olile-anya, onye nāzọcha ọka kwesiri kwa izọcha n'olile-anya na ọ gēketa. 11 Ọ buru na ayi onwe-ayi ghara ihe nke Mọ Nsọ dika nkpuru nye unu, ọ̀ bu ihe uku ma ọ buru na ayi onwe-ayi gēwere ihe nke anu-aru unu dika ihe-ubi? 12 Ọ buru na ndi ọzọ eketa ike a n'ebe unu nọ, àyi onwe-ayi adighi-eketa kari? Otú ọ di, ayi ejighi ike a nara ihe; kama ayi nānagide ihe nile, ka ayi we ghara ib͕ochi ozi ọma Kraist n'uzọ ọ bula. 13 Ùnu amataghi na ndi nālu ọlu n'ulo uku Chineke nēri ihe si n'ulo uku Chineke puta, na ndi nānọ kwa n'iru ebe-ichu-àjà nēso ebe ichu-àjà ahu nēkekọ ihe? 14 Ọbuná otú a ka Onye-nwe-ayi kara àkà ka ndi nēkwusa ozi ọma Ya si n'ozi ọma ahu di ndu. 15 Ma mu onwem, ejighm ihe ọ bula n'ihe ndia nara ihe: edeghi m kwa ihe ndia n'akwukwọ ka ewe me otú a n'ebe m'nọ: n'ihi na ọ kam nma ka m'nwua, kari ka onye ọ bula me ka ihe-inya-isim buru ihe-efu. 16 N'ihi na asi na anam-ezisa ozi ọma, enweghi m ihe inya isi; n'ihi na nkpà nākpam; n'ihi na ahuhu dirim, asi na ezisaghi m ozi ọma. 17 N'ihi na asi na emem ihe a ebe m'nāchọ ime ya, enwerem ugwọ-ọlu: ma ọ buru na emem ya mb͕e m'nāchọghi ime ya, ewerewo ntukwasi-obi nye ọchichi-èzí-na-ulo n'akam. 18 Gini kwa bu ugwọ-ọlum? Mb͕e m'nēzisa ozi ọma, ka m'we me ka ozi ọma ahu buru ihe ego nādighi nime ya, ka m'ghara ijizu ike nkem inara ihe n'ozi ọma ahu. 19 N'ihi na ọ bu ezie na enwerem onwem n'ebe madu nile nọ, ma emerem onwem ka m'buru orù madu nile, ka m'we rita ọtutu madu n'urù kari. 20 N'ebe ndi-Ju nọ m'we di ka onye-Ju, ka m'we rita ndi-Ju n'urù; n'ebe ndi nọ n'okpuru iwu di m'we di ka onye nọ n'okpuru iwu, ọ bughi na mu onwem nọ n'okpuru iwu, ka m'we rita ndi nọ n'okpuru iwu n'urù; 21 n'ebe ndi nēnweghi iwu nọ m'we di ka onye nēnweghi iwu, ọ bughi na enweghm iwu n'ebe Chineke nọ, kama anọm n'okpuru iwu n'ebe Kraist nọ, ka m'we rita ndi nēnweghi iwu n'urù. 22 N'ebe ndi nādighi ike nọ m'ghọrọ onye nādighi ike, ka m'we rita ndi nādighi ike n'urù: aghọwom ihe nile n'ebe madu nile nọ, ka m'we si n'uzọ ọ bula zọputa ufọdu. 23 Ma anameme ihe nile n'ihi ozi ọma, ka m'we ghọ onye nēnwekọ ya. 24 Ùnu amataghi na ndi nāb͕a ọsọ n'ebe ọsọ, ha nile nāb͕a ọsọ, ma ọ bu otù onye nāb͕ata ihe ọsọ? Nāb͕anu otú a, ka unu we b͕ata. 25 Madu ọ bula nke nāb͕asi nb͕a ike ika ibe-ya n'egwú-unu nējide kwa onwe-ya n'ihe nile. Ya mere, ndi ahu nēme ya inata okpu-nmeri nke puru ire uré; ma ayi onwe-ayi nēme ya inata okpu-nmeri nke nāpughi ire uré. 26 Ya mere mu onwem nāb͕a ọsọ otú a, dika onye nādighi-ab͕a nēleghi anya ihe; otú a ka m'nēsu ọkpọ, dika onye nādighi-apia ifufe: 27 ma anametiputa arum ọnyá, me kwa ya ka ọ buru orùm: ka mu onwem ghara ighọ onye ajuru aju n'uzọ ọ bula, mb͕e m'kwusasiri okwu Chineke nye ndi ọzọ.

1 Kọrint 10

1 N'ihi na achọghm, umu-nnam, ka unu ghara imara, na nna-ayi-hà nile nọri n'okpuru igwe-oji ahu, ha nile gabiga-kwa-ra oké osimiri ahu; 2 eme-kwa-ra ha nile baptism ibà nime Moses nime igwe-oji ahu na nime oké osimiri ahu; 3 ha nile ri-kwa-ra otù ihe-oriri ahu nke mọ; 4 ha nile ṅu-kwa-ra otù ihe-ọṅuṅu ahu nke mọ: n'ihi na ha nāṅu miri nke si na nkume nke mọ nke soro ha: nkume ahu bu kwa Kraist. 5 Ma ihe ndi kari n'etiti ha adighi Chineke ezi nma: n'ihi ya akwaturu ha n'ọhia. 6 Ma ihe ndia ghọrọ ihe-atù nye ayi, ka ayi we ghara ibu ndi agu ihe ọjọ nāgu, dika agu ihe ọjọ gu-kwa-ra ndi ahu. 7 Unu aghọ-kwa-la ndi nēkpere arusi, dika ufọdu n'etiti ha ghọrọ; dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ndi Israel nọduru ala iri ihe na iṅu ihe, ha we bilie igwu egwú. 8 Ka ayi ghara kwa ikwa iko, dika ufọdu n'etiti ha kwara, we da nwua n'otù ubọchi, ọgu nnù madu abua na nnù iri na asa na ọgu iri. 9 Ka ayi ghara kwa inwa Onye-nwe-ayi, dika ufọdu n'etiti ha nwara, agwọ we la ha n'iyì. 10 Unu atamu-kwa-la, dika ufọdu n'etiti ha tamuru, onye-nbibi ahu we la ha n'iyì. 11 Ma ihe ndia nēmeri ndi ahu n'uzọ ihe-atù; ewe de ha n'akwukwọ nsọ ka ha we buru ihe idu ayi ọdú, ndi ọgwugwu oge ndia ruteworo. 12 Ya mere, onye nēchè na o nēguzo, ya lezi anya ka ọ ghara ida. 13 Ọ dighi ọnwunwa ọ bula nwaworo unu ma-ọbughi nke madu nānagide: ma Chineke kwesiri ntukwasi-obi, Onye nāgaghi-ekwe ka anwa unu kari nke unu puru inagide; kama n'oge ọnwunwa ahu Ọ gēme kwa uzọ nb͕apu, ka unu we nwe ike inagide ya. 14 N'ihi nka, ndi m'huru n'anya, b͕anarinu ikpere-arusi. 15 Anamekwu dika anamagwa ndi nwere uche; unu onwe-unu tule ihe m'nēkwu. 16 Iko nke ngọzi ahu nke ayi nāgọzi, ọ̀ bughi nnwekọ ọbara Kraist? Achicha ahu nke ayi nānyawa, ọ̀ bughi nnwekọ aru Kraist? 17 n'ihi na otù achicha di, ayi, ọ bu ezie na ayi di ọtutu, ma ayi bu otù aru: n'ihi na ayi nile nēketa òkè n'otù achicha ahu. 18 Lenu Israel dika anu-aru si di: ndi nēri àjà, hà na ebe-ichu-aja adighi-enwekọ? 19 Gini kwa ka m'nēkwu? nà ihe achuru n'aja nye arusi bu ihe ọ bula, ma-ọbu na arusi bu ihe ọ bula? 20 Kama okwu m'nēkwu bu, na ihe ndi mba ọzọ nāchu n'àjà, ha nāchuru ndi-mọ ọjọ, ọ bughi kwa Chineke ka ha nāchuru: ma achọghi m ka unu ghọ ndi unu na ndi-mọ ọjọ nēnwekọ. 21 Unu apughi iṅu iko Onye-nwe-ayi na iko ndi-mọ ọjọ: unu apughi iketa table Onye-nwe-ayi na table ndi-mọ ọjọ. 22 Ma-ọbu àyi nākpasu Onye-nwe-ayi ekworo? àyi ka Ya ike? 23 Ihe nile ziri ezi n'iwu; ma ọ bughi ihe nile bara urù. Ihe nile ziri ezi n'iwu; ma ọ bughi ihe nile nēwuli madu elu dika ulo. 24 Ka onye ọ bula ghara ichọ ọdi-nma nke aka ya, kama ọdi-nma nke madu-ibe-ya. 25 Ihe nile ọ bula anēre n'ahia anu, rienu ya, ghara iju ajuju n'ihi akọ-na-uche; 26 n'ihi na uwa bu nke Onye-nwe-ayi, na ùjú-ya. 27 Ọ buru na onye ọ bula n'etiti ndi nēkweghi akpọ unu n'oriri, ọ buru kwa na unu achọ ije; ihe ọ bula anēdebe n'iru unu, rienu ya, ghara iju ajuju n'ihi akọ-na-uche. 28 Ma ọ buru na onye ọ bula asi unu, Achuru ihe a n'àjà, unu erila, n'ihi onye ahu nke gosiri ya, na n'ihi akọ-na-uche: 29 akọ-na-uche, ka m'kwuru, ọ bughi nke aka gi, kama akọ-na-uche nke madu-ibe-gi; n'ihi na gini mere akọ-na-uche ọzọ nēkpe inwe-onwem ikpé? 30 Ọ buru na mu onwem ji ekele keta, gini mere anēkwulum n'ihi ihe ahu nke mu onwem nēkelere ekele? 31 Ya mere ma unu nēri ihe, ma unu nāṅu ihe, ma unu nēme ihe ọ bula, nēmenu ihe nile ka ewe nye Chineke otuto. 32 Unu aghọla ndi nēme ndi-Ju, ma-ọbu ndi-Grik, ma-ọbu nzukọ Chineke, ka ha su ngọngọ: 33 dika mu onwem nēme kwa ihe nātọ madu nile n'ihe nile, nāchọghi urù nke akam, kama urù nke madu nile, ka ewe zọputa ha.

1 Kọrint 11

1 Ghọnu ndi nēṅomim, dika mu onwem bu kwa onye nēṅomi Kraist. 2 Ma anamaja unu na unu nēchetam n'ihe nile, jisi kwa ozizí ahu enyere n'aka-unu idebe ike, dika m'nyere ha n'aka-unu idebe. 3 Ma anamachọ ka unu mata na Kraist bu isi nke nwoke ọ bula; nwoke bu kwa isi nke nwanyi; Chineke bu kwa isi nke Kraist. 4 Nwoke ọ bula, mb͕e ọ nēkpe ekpere ma-ọbu mb͕e ọ nēbu amuma, ọ buru na o kpu ihe-nkpudo n'isi-ya, ọ nēme ka ihere me isi-ya. 5 Ma nwanyi ọ bula, mb͕e ọ dighi-ekpudo ihe n'isi-ya n'ikpe ekpere ma-ọbu n'ibu amuma, ọ nēme ka ihere me isi-ya: n'ihi na ya na nwanyi nke akọpuworo isi-ya bu otù ihe ahu. 6 N'ihi na asi na nwanyi ekpudoghi onwe-ya ihe n'isi, ka akpacha kwa agiri-isi-ya: ma asi na ọ buru nwanyi ihe-ihere ka akpacha agiri-isi-ya ma-ọbu ka akọpu isi-ya, ka ekpudo ya ihe n'isi. 7 N'ihi na nwoke ekwesighi n'ezie ka ekpudo ya ihe n'isi, ebe ọ bu onyinyo na otuto nke Chineke: ma nwanyi bu otuto nke nwoke. 8 N'ihi na nwoke esighi na nwanyi puta; kama nwanyi siri na nwoke puta: 9 n'ihi na ekèghi kwa nwoke n'ihi nwanyi; kama ekère nwanyi n'ihi nwoke: 10 n'ihi nka ka nwanyi kwesiri ikpu ihe-iriba-ama nke ike n'isi-ya, n'ihi ndi-mọ-ozi. 11 Otú ọ di, nwanyi adighi ma nwoke anọghi ya, nwoke adighi kwa ma nwanyi anọghi ya, nime Onye-nwe-ayi. 12 N'ihi na dika nwanyi siri na nwoke puta, otú a ka nwoke site-kwa-ra n'aka nwanyi; ma ihe nile si na Chineke puta. 13 Tulenu nime onwe-unu: ọ̀ kwesiri ka nwanyi kpere Chineke ma ekpudoghi ya ihe n'isi? 14 Ọbuná uzọ ekère madu, yà onwe-ya adighi-ezí unu, na, asi na nwoke nwere ogologo agiri-isi, na ọ buru ya ihe-ihere? 15 Ma ọ buru na nwanyi nwere ogologo agiri-isi, ọ buru ya ihe otuto: n'ihi na enyewo ya agiri-isi-ya n'ọnọdu ihe ib͕okwasi n'aru. 16 Ma ọ buru na unu nēchè na onye ọ bula bu onye nēse okwu, ayi onwe-ayi, ma-ọbu nzukọ Chineke, enweghi ọme-n'ala di otú a. 17 Ma n'inye unu iwu a, etoghm unu, na unu adighi-abiakọ n'otù ebe ka unu we dikari nma, kama ka unu we jọkari njọ. 18 N'ihi na ihe mbu, mb͕e unu biakọrọ na nzukọ, anurum na nkewa di iche iche nādi n'etiti unu; ekwe-kwa-ram ya ufọdu. 19 N'ihi na irọ-òtù di iche iche aghaghi idi kwa n'etiti unu, ka ndi anwaputaworo we ghọ ndi putara ìhè n'etiti unu. 20 Ya mere mb͕e unu biakọrọ n'otù ebe, ọ bughi iri nri-anyasi nke Onye-nwe-ayi: 21 n'ihi na madu nile n'otù n'otù, mb͕e unu nēri, nēburu ndi ọzọ uzọ rie nri-anyasi nke aka ha; agu we nāgu otù onye, onye ọzọ nāṅubiga kwa manya ókè. 22 Ọ̀ gābu na unu enweghi nọ̄ ulo iri ihe na iṅu ihe-ọṅuṅu nime ha? ma-ọbu ùnu nēlelì nzukọ Chineke, me kwa ndi nēnweghi ihe ka ihere me ha? Ọ̀ bu gini ka m'gāsi unu? #m'gēto unu? Etoghi m unu na nka. 23 N'ihi na mu onwem natara n'aka Onye-nwe-ayi ihe m'nye-kwa-ra unu n'aka idebe, na Onye-nwe-ayi Jisus n'abali ahu nke arara Ya nye n'aka madu, Ọ nara ob͕e achicha, 24 kele kwa, we nyawa ha, si, Nka bu arum, nke anēnye n'ihi unu: nēmenu nka ka unu we nēchetam. 25 Mb͕e ha risiri nri-anyasi, Ọ nara kwa iko otú ahu, si, Iko a bu ọb͕ub͕a-ndu ọhu nime ọbaram: nēmenu nka, mb͕e ọ bula unu gāṅu ya, ka unu we nēchetam. 26 N'ihi na mb͕e ọ bula unu nēri achicha nka, nāṅu kwa iko ahu, unu nēkwusa ọnwu Onye-nwe-ayi rue mb͕e Ọ gābia. 27 Ya mere onye ọ bula nke gēri achicha ahu ma-ọbu ṅu iko ahu nke Onye-nwe-ayi mb͕e ọ nēkwesighi, ikpé aru na ọbara nke Onye-nwe-ayi gāma ya. 28 Ma ka madu nwaputa onwe-ya, otú a ka o ri kwa nime achicha ahu, ṅu kwa nime iko ahu. 29 N'ihi na onye nēri nāṅu kwa, ọ nēri nāṅu kwa ikpé nye onwe-ya, ma ọ buru na ọ tuleghi aru ahu. 30 N'ihi nka ọtutu madu n'etiti unu adighi ike nāria kwa nriaria, ndi dawo-kwa-ra n'ura nke ọnwu abughi madu ole-na-ole. 31 Ma ọ buru na ayi atule onwe-ayi, agaghi-ekpe ayi ikpé. 32 Ma mb͕e anēkpe ayi ikpé, Onye-nwe-ayi nēzí ayi ihe, site n'inye ayi ahuhu, ka ewe ghara imakọ ayi na uwa ikpé. 33 Ya mere, umu-nnam, mb͕e unu biakọrọ n'otù ebe iri ihe, cherenu ibe-unu. 34 Ọ buru na agu nāgu onye ọ bula, ya rie ihe n'ulo-ya; ka unu ghara ibiakọ n'uzọ gēweta ikpé. Ihe nile fọduru ka m'gēdozi mb͕e ọ bula m'gābia.

1 Kọrint 12

1 Ma okwu bayere onyinye nke Mọ Nsọ, umu-nnam, achọghi m ka unu ghara imara. 2 Unu matara na mb͕e unu buri ndi mba ọzọ, anēdufu unu iso arusi ahu dara ob͕i, n'uzọ ọ bula anēdu unu. 3 N'ihi nka emem ka unu mara na ọ dighi onye ọ bula nke nēkwu okwu nime Mọ nke Chineke nāsi, Jisus bu anathema; ọ dighi kwa onye ọ bula puru isi, Jisus bu Onye-nwe-ayi, ma-ọbughi nime Mọ Nsọ. 4 Ma òkìkè nke onyinye-amara di, ma ọ bu otù Mọ Nsọ ahu. 5 Òkìkè nke ije-ozi di kwa, otù Onye-nwe-ayi ahu di kwa. 6 Òkìkè ihe alutaworo n'ọlu di kwa, ma ọ bu otù Chineke ahu, Onye nālusi ihe nile ike nime ayi nile. 7 Ma anēnye madu nile n'otù n'otù n'etiti ayi ngosi nke Mọ Nsọ ka o we ba urù. 8 N'ihi na anēsite n'aka Mọ Nsọ nye otù onye okwu amam-ihe; anēnye kwa onye ọzọ okwu ọmuma, di ka Mọ ahu nāchọ: 9 nye kwa ibe-ya okwukwe, nime otù Mọ ahu; nye kwa onye ọzọ onyinye-amara nile ime ka aru madu di ike, nime otù Mọ nka; 10 nye kwa onye ọzọ nluputa nke ọlu di ike; nye kwa onye ọzọ obubu-amuma; nye kwa onye ọzọ itule mọ di iche iche; nye kwa ibe-ya aha asusu di iche iche; nye kwa onye ọzọ isughari asusu: 11 ma ihe ndia nile ka otù Mọ ahu nālusi ike, nání Ya, nēkère madu nile n'otù n'otù, ebe onye ọ bula nọ O kère ya dika Ọ nāchọ. 12 N'ihí na dika aru-ayi bu otù, nwe kwa ọtutu ihe di ya nime, ma ihe nile nke di n'aru, ọ bu ezie na ha di ọtutu, ma ha bu otù aru; otú a ka Kraist di kwa. 13 N'ihi na nime otù Mọ Nsọ ka emere ayi onwe-ayi nile baptism ibà n'otù aru, ma ayi bu ndi-Ju ma-ọbu ndi-Grik, ma ayi bu ndi-orù ma-ọbu ndi nwere onwe-ha; eme-kwa-ra ka ayi nile ṅua nime otù Mọ Nsọ. 14 N'ihi na aru-ayi abughi nání otù ihe nke di ya nime, kama ọ bu ọtutu ihe. 15 Ọ buru na ukwu gāsi, N'ihi na abughi m aka, abughi m nke aru; ọ bughi ihe nābughi nke aru n'ihi nka. 16 Ọ buru kwa na nti gāsi, N'ihi na abughi m anya, abughi m nke aru; ọ bughi ihe nābughi nke aru n'ihi nka. 17 Ọ buru na aru dum bu anya, òle ebe ka ihe-ọnunu di? Ọ buru na aru dum bu ihe-ọnunu, òle ebe ka ihe inu isìsì di? 18 Ma otú ọ di, Chineke debere ihe di n'aru, ha nile n'otù n'otù, nime aru, dika Ọ chọrọ. 19 Ma asi na ha nile bu otù ihe di n'aru, òle ebe ka aru di? 20 Ma otú ọ di, ha di ọtutu ihe di n'aru, ma ha bu otù aru. 21 Ọzọ, anya apughi isi aka, Nkpà gi akpaghi m: ọzọ kwa, isi apughi isi ukwu, Nkpà unu akpaghm. 22 Kama ọ bu ihe ahu di n'aru nke anēchè na ha adighi ike kari bu ihe di nkpà kari nke-uku: 23 akuku ahu nke aru, nke ayi nēchè na adighi-asọpuru ha dika akuku ọzọ, akuku ndia ka ayi nēnyebiga kwa nsọpuru ókè kari; akuku aru nke ayi nke nādighi kwa nma n'anya bu nke mabigara ókè kari; 24 ma nkpà akpaghi akuku aru nke ayi nke mara nma: kama Chineke tigwara aru n'otù, akuku aru ahu nke nsọpuru fọduru ya inwe ka Ọ nēnyebiga nsọpuru ókè kari; 25 ka nkewa we ghara idi n'aru; kama ka ihe di n'aru we nēcheb͕u onwe-ha nye ibe-ha n'otù uzọ ahu. 26 Ọ buru kwa na otù ihe nke di n'aru nāhu ahuhu, ihe nile di n'aru ahu soro ya nāhukọ ahuhu; ọ buru kwa na anēnye otù ihe di n'aru otuto, ihe nile di n'aru ahu soro ya ṅurikọ ọṅu. 27 Ma unu onwe-unu bu aru nke Kraist, buru kwa ihe di n'aru, onye ọ bula n'akuku nke ya. 28 Chineke debe-kwa-ra ufọdu nime nzukọ-Ya, nke-mbu ndi-ozi, nke-abua ndi-amuma, nke-atọ ndi-ozizí, nke so ha ọlu di ike, nke so ha onyinye-amara di iche iche ime ka aru madu di ike, iye-aka, ichi-isi, aha asusu di iche iche. 29 Ọ̀ gābu na ha nile bu ndi-ozi? ọ̀ gābu na ha nile bu ndi-amuma? ọ̀ gābu na ha nile bu ndi-ozizí? ọ̀ gābu na ha nile bu ndi nālu ọlu di ike? 30 ọ̀ gābu na ha nile nwere onyinye-amara ime ka madu di ike? ọ̀ gābu na ha nile ji asusu di iche iche nēkwu okwu? ọ̀ gābu na ha nile nāsughari asusu? 31 Ma werenu obi nānu ọku chọ onyinye-amara ndia nke kari uku. Tukwasi ihe ndia anamegosi kwa unu uzọ nke kachasi nma.

1 Kọrint 13

1 Asi na ejim asusu di iche iche nke madu na nke ndi-mọ-ozi nēkwu okwu, ma enweghi m ihu-n'anya, aghọwom ọla nāra ara, ma-ọbu ájà ọla nāda udà. 2 Asi kwa na enwerem onyinye ibu-amuma, mata kwa ihe-omimi nile na ihe-ọmuma nile; asi kwa na enwerem okwukwe nile, nke mere m'gēnwe ike ibubiga ugwu, ma enweghi m ihu-n'anya, abughm ihe ọ bula. 3 Asi kwa na ewerem ihe nile m'nwere zùa ndi-ob͕eye, asi kwa na araram arum nye ka ewe rem ọku, ma enweghm ihu-n'anya, ọ baghm urù ọ bula. 4 Ihu-n'anya nwere ogologo-ntachi-obi, o nwe-kwa-ra obi-ọma; ihu-n'anya adighi-ekwo ekworo; ihu-n'anya adighi-anya isi, ọ dighi-afuli onwe-ya elu, 5 ọ dighi-eme ihe nādighi nma n'anya, ọ dighi-achọ ihe nke aka ya, oké iwe adighi-ewe ya, ọ dighi-agu ihe ọjọ emere ya; 6 ọ dighi-aṅuri ọṅu nime ajọ omume, ma ọ nēso ezi-okwu ṅurikọ ọṅu; 7 ọ nānagide ihe nile, nēkwere ihe nile, nēle anya ihe nile, nēnwe ntachi-obi n'ihe nile. 8 Ihu-n'anya adighi-ada mb͕e ọ bula: ma ọ buru na ibu-amuma di, agēme ka ha ghara idi irè; ọ buru kwa na asusu di iche iche di, ha gāgwu; ọ buru kwa na ihe-ọmuma di, agēme ka ọ ghara idi irè. 9 N'ihi na ayi mara na nkpirikpi, ayi nēbu kwa amuma na nkpirikpi: 10 ma mb͕e ọ bula ihe nke zuru okè gābia, agēme ihe, nke di na nkpirikpi ka ọ ghara idi irè. 11 Mb͕e m'buri nwa ọhu, anamekwu dika nwa ọhu, anamatukwasi uche n'ihe dika nwa ọhu, anamagu ihe dika nwa ọhu: ub͕u a mb͕e m'ghọworo okenye, emewom ka omume nwa ọhu ghara idi irè. 12 N'ihi na ub͕u a ayi ji enyo hu ihe, nime ilu; ma mb͕e ahu ayi gāhu iru na iru: ub͕u a m'mara na nkpirikpi; ma mb͕e ahu m'gāmazu dika amazu-kwa-ram. 13 Ma ub͕u a ka okwukwe, olile-anya, ihu-n'anya, ihe atọ ndia, nānọgide; ma nke kachasi n'ihe ndia bu ihu-n'anya.

1 Kọrint 14

1 Nāb͕asonu ihu-n'anya; otú ọ di, werenu obi nānu ọku chọ onyinye-amara nile nke Mọ Nsọ, ma nāchọkarinu ka unu bū amuma. 2 N'ihi na onye ji asusu di iche nēkwu okwu, ọ dighi-agwa madu okwu, kama ọ nāgwa Chineke; n'ihi na ọ dighi onye ọ bula nānu ihe ọ nēkwu; ma o ji mọ-ya nēkwu ihe-omimi. 3 Ma onye nēbu amuma nāgwa madu okwu nke iwuli-elu dika ulo, na nke nkasi-obi, na nke ngugu-obi. 4 Onye ji asusu di iche nēkwu okwu nēwuli onwe-ya elu dika ulo; ma onye nēbu amuma nēwuli nzukọ Kraist elu dika ulo. 5 Otú ọ di, anamachọ ka unu nile ji asusu di iche iche nēkwu okwu, ma achọkaririm ka unu nēbu amuma: onye nēbu amuma ka kwa onye ji asusu di iche iche nēkwu okwu, ma-ọbughi na ọ nāsughari ya, ka ewe wuli nzukọ Kraist elu dika ulo. 6 Ma otú ọ di, umu-nnam, asi na agamabiakute unu were asusu di iche iche nēkwu okwu, ùrù gini ka m'gābara unu, asi na agwaghi m unu okwu n'uzọ nkpughe, ma-ọbu n'uzọ ihe-ọmuma, ma-ọbu n'uzọ ibu-amuma, ma-ọbu n'uzọ ozizí? 7 Ọbuná ihe nējighi ndu, mb͕e olu-ha nāda udà, ma ọ bu ọ̀jà ma-ọbu ubọ-akwara, ọ buru na ọ dighi ihe di iche n'olu-ha, àgēsi aṅa mara ihe anāfù ma-ọbu nke anākpọ? 8 N'ihi na asi kwa na opì nāda nke anāmaghi isi-ya, ònye gākwadebe onwe-ya ije agha? 9 Otú a unu onwe-unu kwa, ma ọ buru na unu ejighi ire kwu okwu di nfe ighota, àgēsi aṅa mara ihe anēkwu? n'ihi na unu ganēkwu okwu nye ifufe. 10 Agāsi na ọtutu aha olu di iche iche di n'uwa, ọ dighi kwa ihe ọ bula nke nēnweghi olu. 11 Ya mere asi na amataghm isi olu ahu, m'gābu onye nāsu asusu ọzọ n'anya onye ahu nēkwu okwu, onye ahu nēkwu okwu gābu kwa onye nāsu asusu ọzọ n'anyam. 12 Otú a unu onwe-unu kwa, ebe unu bu ndi nēwere obi nānu ọku chọ onyinye nile nke Mọ Nsọ, nāchọnu ka unu we babiga ókè nime ha, ka ewe wuli nzukọ Kraist elu dika ulo. 13 N'ihi nka onye ji asusu di iche nēkwu okwu, ya kpere Chineke ka o we sugharia. 14 N'ihi na asi na ejim asusu di iche nēkpe ekpere, mọm nēkpe ekpere, ma uchem amighi nkpuru. 15 Ọ̀ bu gini kwa? m'gēji mọm kpe ekpere, ma m'gēji kwa uchem kpe ekpere: m'gēji mọm bù abù ọma, ma m'gēji kwa uchem bù abù ọma. 16 Ma emeghi otú a, onye nọ n'ọnọdu onye nāmutaghi akwukwọ gēsi aṅa si Amen ahu mb͕e i nēkele ekele, ma ọ buru na i ji mọ-gi nāgọzi, ebe ọ nāmataghi ihe ọ bula i nēkwu? 17 N'ihi na ọ bu ezie na gi onwe-gi nēkele nke-ọma, ma ewulighi ibe-gi elu dika ulo. 18 Ekelem Chineke, na ejim asusu di iche iche nēkwu okwu kari unu nile: 19 otú ọ di, nime nzukọ Kraist anamachọ ka m'ji uchem kwu nkpuru okwu ise, ka m'were okwu-ọnum zí kwa ndi ọzọ ihe, kari ikwu orú nnù okwu na nnù ise n'asusu di iche. 20 Umu-nnam, unu abula umu-ntakiri n'uche-unu: kama burunu umu ọhu n'obi ọjọ, ma n'uche-unu burunu ndi tozuru okè. 21 Nime iwu Chineke ka edeworo ya, si, M'gēji madu ndi nāsu asusu di iche, ji kwa eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi di iche, gwa ndi nka okwu; ma ọbuná otú a ha agaghi-anu olum, ka Onye-nwe-ayi kwuru. 22 Ya mere asusu di iche iche ndia, emere ka ha buru ihe-iriba-ama, ọ bughi nye ndi kwere ekwe, kama nye ndi nēkweghi ekwe: ma emere ibu-amuma ka ọ buru ihe-iriba-ama, ọ bughi nye ndi nēkweghi ekwe, kama nye ndi kwere ekwe. 23 Ya mere asi na nzukọ Kraist dum biakọrọ n'otù ebe, asi kwa na ha nile ji asusu di iche iche nēkwu okwu, ma ọ buru na ndi nāmutaghi akwukwọ ma-ọbu ndi nēkweghi ekwe gābata, hà agaghi-asi na anya adighi unu nma? 24 Ma asi na ha nile ebu amuma, ma ọ buru na onye nēkweghi ekwe ma-ọbu onye nāmutaghi akwukwọ gābata, ha nile nātu ya nmehie-ya n'anya, ha nile nēkpe kwa ya ikpé; 25 ihe-nzuzo nile nke obi-ya aputa ìhè; ọ gēsi otú a da kpuchie iru-ya n'ala kpọ kwa isi ala nye Chineke, nēkwuputa na ọ bu ezie na Chineke nọ n'etiti unu. 26 Ọ̀ bu gini kwa, umu-nnam? mb͕e ọ bula unu biakọrọ n'otù ebe, unu nile n'otù n'otù ji abù ọma, ji ihe-ozizí, ji ihe-nkpughe, ji asusu di iche, ji isughari-asusu. Ka eme ihe nile ka ewe wuli madu nile elu dika ulo. 27 Ọ buru na onye ọ bula eji asusu di iche nēkwu okwu, ka ọ buru ihe ra ka madu abua gēkwu, ma ka ha ghara ika madu atọ, ka ha kwu kwa n'usoro; ka otù onye sughari kwa: 28 ma asi na ọ dighi onye nāsughari asusu nọ n'etiti unu, ya kpuchie ọnu-ya nime nzukọ Kraist; ya gwa onwe-ya na Chineke okwu. 29 Ka ndi-amuma kwu kwa okwu, madu abua ma-ọbu madu atọ, ka ndi ọzọ tule kwa. 30 Ma asi na ekpughere onye ọzọ nke nọdu n'akuku ya ihe, ka onye mbu kpuchie ọnu-ya. 31 N'ihi na unu nile puru ibu amuma n'otù n'otù, ka madu nile we muta ihe, ka ewe kasi kwa madu nile obi; 32 anēdo kwa mọ nile nke ndi-amuma n'okpuru ndi-amuma; 33 n'ihi na Chineke abughi Chineke nke aghara, kama Ọ bu Chineke nke udo; otú ọ di nime nzukọ nile nke ndi nsọ. 34 Ka ndinyom-unu kpuchie ọnu-ha nime nzukọ-unu: n'ihi na ekweghi ha ka ha kwue okwu; kama ka ha do onwe-ha n'okpuru ike, dika iwu Chineke nēkwu kwa. 35 Ọ buru kwa na ha nāchọ imuta ihe ọ bula, ka ha jua di nke aka ha n'ulo: n'ihi na ọ bu ihe-ihere ka nwanyi kwue okwu nime nzukọ Kraist. 36 Ọ̀ gābu na okwu Chineke si n'ebe unu nọ puta? ma-ọbu ò ruru nání unu? 37 Ọ buru na onye ọ bula nēchè na ya bu onye-amuma, ma-ọbu onye nwere onyinye Mọ Nsọ, ya mazu ihe m'nēdegara unu n'akwukwọ, na ha bu ihe Onye-nwe-ayi nyere n'iwu. 38 Ma ọ buru na onye ọ bula amaghi ihe ndia, ọ bu onye anāmaghi ama. 39 Ya mere, umu-nnam, werenu obi nānu ọku chọ ka unu bu amuma, unu eb͕ochi-kwa-la iji asusu di iche iche nēkwu okwu. 40 Ma ka eme ihe nile n'uzọ di nma n'anya, na n'usoro.

1 Kọrint 15

1 Ma emem ka unu mara, umu-nnam, ozi ọma ahu nke m'zìri unu, nke unu nata-kwa-ra, nke unu nēguzo kwa nime ya, 2 nke esite-kwa-ra zọputa unu, ma ọ buru na unu jidesie ya ike, bú aha okwu m'ji zì unu ozi ọma ahu, ma asi na ọ bughi na unu kwere n'efu. 3 N'ihi na enyerem n'aka-unu na mbu ihe m'nata-kwa-ra idebe, na Kraist nwuru n'ihi nmehie-ayi nile, dika ihe edeworo n'akwukwọ nsọ si di; 4 na elì-kwa-ra Ya; na emewo-kwa-ra ka O si n'ọnwu bilie n'ubọchi nke-atọ, dika ihe edeworo n'akwukwọ nsọ si di; 5 na O me-kwa-ra ka Kifas hu Ya anya; emesia O mere ka ndi-ozi iri na abua ahu hu Ya anya; 6 emesia O mere ka ndi kari nnù madu na ọgu ise n'etiti umu-nna-ayi hu Ya anya n'otù mb͕e, ndi ka n'ọnu-ọgugu n'etiti ndi ahu nānọgide rue ub͕u a, ma ufọdu adawo n'ura ọnwu; 7 emesia O mere ka Jemes hu Ya anya; emesia O mere ka ndi-ozi nile hu Ya anya; 8 ma n'ikpe-azu ha nile, dika nwa amukworo amukwo, O mere ka mu onwem hu kwa Ya anya. 9 N'ihi na mu onwem dikarisiri ntà n'etiti ndi-ozi, ebe m'nērughi ka akpọm onye-ozi, n'ihi na esob͕urum nzukọ Chineke. 10 Ma site n'amara Chineke abum ihe m'bu: ahu-kwa-ra na amara-Ya nke enyerem abughi ihe-efu; kama adọb͕ubigaram onwem ókè n'ọlu kari ha nile: ma ọ bughi mu onwem, kama amara Chineke nke sorom. 11 Ya mere ma ọ buru mu onwem, ma-ọbu ndi ahu, otú a ka ayi nēkwusa, otú a ka unu kwe-kwa-ra. 12 Ma ọ buru na anēkwusa na emewo ka Kraist si na ndi nwuru anwu bilie, ùfọdu n'etiti unu si aṅa nēkwu na nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu adighi? 13 Ma ọ buru na nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu adighi, emeghi kwa ka Kraist si n'ọnwu bilie: 14 ma ọ buru na emeghi ka Kraist si n'ọnwu bilie, ya mere ihe ayi nēkwusa bu ihe-efu, okwukwe-unu bu kwa ihe-efu. 15 Ọzọ kwa, anāhu na ayi bu ndi-àmà ugha nke Chineke; n'ihi na ayi b͕ara àmà megide Chineke na O mere ka Kraist ahu si n'ọnwu bilie; bú Onye Ọ nēmeghi ka O si n'ọnwu bilie, ma ọ buru na ọ bu ezie na emeghi ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie. 16 N'ihi na asi na emeghi ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie, emeghi kwa ka Kraist si n'ọnwu bilie: 17 ma ọ buru na emeghi ka Kraist si n'ọnwu bilie, okwukwe-unu bu ihe-efu; unu nānọ na nmehie nile unu ub͕u a. 18 Ya mere ndi da-kwa-ra n'ura ọnwu nime Kraist lara n'iyì. 19 Asi na ọ bu nání na ndu a ka ayi nweworo olile-anya-ayi nime Kraist, ayi bu ndi kwesiri ebere kari madu nile. 20 Ma otú ọ di, emewo ka Kraist si na ndi nwuru anwu bilie, nkpuru mbu nke ndi daworo n'ura ọnwu. 21 N'ihi na ebe ọnwu sitere n'aka madu, nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu site-kwa-ra n'aka madu. 22 N'ihi na dika ọnwu diri madu nile nime Adam, ọ bu kwa otú a ka agēme ka madu nile di ndu nime Kraist ahu. 23 Ma madu nile n'otù n'otù n'usoro nke aka ha: Kraist, dika nkpuru mbu; emesia ndi nke Kraist, n'ọbibia-Ya. 24 Emesia ọgwugwu ihe nile gābia, mb͕e ọ bula Ọ gārara ala-eze-Ya nye n'aka Chineke, Onye bu kwa Nna; mb͕e ọ bula Ọ gēmewori ka ọbubu-isi nile na ichi-isi nile na ike nile ghara idi irè. 25 N'ihi na Ọ ghaghi ibu eze, rue mb͕e Ọ gēdebewori ndi-iro-Ya nile n'okpuru ukwu-Ya. 26 Dika onye-iro ikpe-azu, agaje ime ka ọnwu ghara idi irè. 27 N'ihi na, Ihe nile ka O doro n'okpuru ukwu-Ya abua. Ma mb͕e ọ bula O gēkwuwori, si, Edowo ihe nile n'okpuru Ya, ọ putara ìhè na Ọ nọghi ya, bú Onye doro ihe nile n'okpuru Ya. 28 Ma mb͕e ọ bula agēdowori ihe nile n'okpuru Ya, mb͕e ahu ka agēdo Ọkpara ahu Onwe-ya n'okpuru Onye ahu Nke doro ihe nile n'okpuru Ya, ka Chineke we buru ihe nile nime ihe nile. 29 N'ihi na asi na ọ dighi otú a, gini ka ha gēme, bú ndi anēme baptism n'ọnọdu ndi nwuru anwu? Ọ buru na emeghi ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie ma-ọli, ọ̀ bu kwa gini mere anēme ha baptism n'ọnọdu ha? 30 Gini me-kwa-ra ayi onwe-ayi nānọ n'ize-ndu oge hour nile ọ bula? 31 Ejim inya-isi ahu n'aru-unu, umu-nnam, nke m'nānya nime Kraist Jisus Onye-nwe-ayi, we kwusie ike na anamanwu kwa-ubọchi. 32 Ọ buru na abumri onye nālu ọ̀gù megide anu-ọhia n'Efesọs dika madu si eme, ùrù gini baram? Ọ buru na emeghi ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie, ka ayi rie ṅu kwa, n'ihi na echi ka ayi gānwu. 33 Unu ekwela ka eduhie unu: Nkparita nile ọjọ nēmebi omume ọma. 34 Sinu n'ura manya teta n'uzọ ezi omume, unu emehie-kwa-la; n'ihi na ufọdu nēnwe amaghi-ihe bayere Chineke: anamekwu nka ka m'me unu ihere n'iru. 35 Ma otù onye gāsi, Èsi aṅa eme ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie? ọ̀ bu kwa ahà aru gini ka ha ji bia? 36 Onye nēnweghi uche, adighi-eme ka nkpuru gi onwe-gi nāgha di ndu, ma ọ buru na ọ nwughi anwu: 37 ihe i nāgha kwa, ọ bughi aru gāputa ka i nāgha, kama ọ bu nkpuru efu, ma eleghi anya ọ gābu ọka, ma-ọbu nkpuru ọ bula nime nkpuru fọduru; 38 ma Chineke nēnye ya aru dika Ọ chọrọ, nēnye kwa nkpuru ọ bula nime nkpuru nile aru nke aka ya. 39 Anu-aru nile abughi otù anu-aru: kama otù anu-aru nke madu di, anu-aru ọzọ nke anumanu di kwa, anu-aru ọzọ nke nnunu di kwa, anu-aru ọzọ nke azù di kwa. 40 Aru nke elu-igwe na aru nke uwa di kwa: ma ebube nke aru nke elu-igwe bu otù, ebube nke aru nke uwa di kwa iche. 41 Otù ebube nke anyanwu di, ebube ọzọ nke ọnwa di kwa, ebube ọzọ nke kpakpando di kwa; n'ihi na otù kpakpando di iche n'aru kpakpando ọzọ n'ebube. 42 Otú a ka nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu di kwa. Anāgha ya n'ire-uré; anēme ka o si n'ọnwu bilie n'ereghi-uré: 43 anāgha ya n'ihe-ihere; anēme ka o si n'ọnwu bilie n'ebube: anāgha ya n'adighi-ike; anēme ka o si n'ọnwu bilie n'ike: 44 anāgha ya aru nke nkpuru-obi nāchi; anēme ka o si n'ọnwu bilie aru nke Mọ di nime ya nāchi. Ọ buru na aru nke nkpuru-obi nāchi di, aru nke Mọ nāchi di kwa. 45 Otú a ka edewo-kwa-ra ya n'akwukwọ, si, Madu mbu, bú Adam, ghọrọ nkpuru-obi di ndu. Adam ikpe-azu ghọrọ mọ nke nēnye ndu. 46 Otú ọ di, nke Mọ nāchi ebughi uzọ, kama ọ bu nke nkpuru-obi nāchi; emesia nke Mọ nāchi soro. 47 Madu mbu sitere n'ala, eji-kwa-ra ájá kpu ya: Madu nke-abua sitere n'elu-igwe. 48 Aha madu onye ahu ejiri ájá kpu di, madu di otú a ka ndi eji ájá kpu di kwa: ọzọ, aha madu Onye elu-igwe ahu di, madu di otú a ka ndi elu-igwe di kwa. 49 Dika ayi yiri kwa onyinyo nke onye ahu eji ájá kpu, ayi gēyiri kwa onyinyo nke Onye elu-igwe ahu. 50 Ma nka ka m'nēkwu, umu-nnam, na anu-aru na ọbara apughi iketa ala-eze Chineke; ihe nēre uré eketaghi kwa ereghi-uré. 51 Le, agwam unu ihe-omimi: Ọ bughi ayi nile gāda n'ura ọnwu, ma agēnwo ayi nile, 52 n'oge dikarisiri ntà, n'otù ntabi-anya, mb͕e agāfù opì ikpe-azu: n'ihi na agāfù opì, agēme kwa ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie nāpughi ire uré, agēnwo kwa ayi onwe-ayi. 53 N'ihi na aru a nke puru ire uré aghaghi iyikwasi ereghi-uré, aru a nke puru inwu anwu aghaghi iyikwasi anwughi-anwu. 54 Ma mb͕e ọ bula aru a nke puru ire uré gēyikwasiwori ereghi-uré, mb͕e aru a nke puru inwu anwu gēyikwasiwori anwughi-anwu kwa, mb͕e ahu okwu ahu edeworo n'akwukwọ nsọ gēme, bú, Eloro ọnwu rue nmeri. 55 Ọnwu, òle ebe nmeri-gi di? Ọnwu, òle ebe ihe-ọb͕ub͕a-gi di? 56 Ihe-ọb͕ub͕a nke ọnwu bu nmehie; ike nke nmehie bu kwa iwu: 57 ma ekele diri Chineke, Onye nēnye ayi nmeri site n'aka Onye-nwe-ayi Jisus Kraist. 58 Ya mere, umu-nnam m'huru n'anya, guzosienu ike, burunu ndi anāpughi iropu eropu, ndi nālubiga ọlu Onye-nwe-ayi ókè mb͕e nile, ebe unu matara na ndọb͕u unu nādọb͕u onwe-unu n'ọlu abughi ihe-efu nime Onye-nwe-ayi.

1 Kọrint 16

1 Ma okwu bayere ùtú anāturu ndi nsọ, dika m'nyere nzukọ Kraist di na Galetia iwu, unu onwe-unu me kwa otú a. 2 Kwa ubọchi mbu n'ízù ubọchi asa ka unu nile n'otù n'otù debe ihe n'ulo nākpado ya, otú ihe nāgara onye ọ bula nke-ọma, ka aghara inara ùtú mb͕e ọ bula m'gābia. 3 Ma mb͕e ọ bula m'biaruru, ndi ọ bula unu gānwaputa, m'gēwere akwukwọ-ozi ziga ndi ahu ibūru ihe-amara-unu je Jerusalem: 4 ma asi na ọ kwesiri ka mu onwem je kwa, ha gēsom je. 5 Ma m'gābiakute unu, mb͕e ọ bula m'gāgabigasi nime Masedọnia; n'ihi na agajem igabiga nime Masedọnia; 6 ma eleghi anya na nke unu ka m'gānọgide, ma-ọbu nọbiga kwa na mb͕e oyi, ka unu we dupum n'ijem ebe ọ bula m'nāga. 7 N'ihi na achọghi m ihu unu ub͕u a n'uzọ ijem; n'ihi na anamele anya na m'gānọgide na nke unu oge ufọdu, ma asi na Onye-nwe-ayi gēkwe. 8 Ma m'gānọgide n'Efesọs rue oge Pentikọst; 9 n'ihi na emegheworom ọnu-uzọ di uku nke agēji kwa lusi ọlu ike, ọzọ, ọtutu ndi nēmegidem. 10 Ma asi na Timọti abia, lezienu anya ka ọ nọgide na nke unu nātughi egwu; n'ihi na ọ nālu ọlu Onye-nwe-ayi, dika mu onwem nālu kwa: 11 ya mere, ka onye ọ bula ghara ikpọ ya ihe-efu. Kama dupunu ya n'ije-ya n'udo, ka o we biakutem: n'ihi na anamele anya na ọ gēso umu-nna-ayi bia. 12 Ma okwu bayere Apọlos nwa-nna-ayi, ariọrọm ya ọtutu aririọ ka o so umu-nna-ayi biakute unu: ma ihe ọ chọrọ abughi ka ọ bia ub͕u a ma-ọli; ma ọ gābia mb͕e ọ bula o nwere oghere. 13 Nēchenu nche, nēguzosinu ike n'okwukwe-unu, burunu ndikom, nādinu ike. 14 Ka eme ihe-unu nile n'ihu-n'anya. 15 Ma ariọm unu, umu-nnam, (unu matara èzí-na-ulo Stefanas, na ọ bu nkpuru mbu nke Akaia, na ha do-kwa-ra onwe-ha ijere ndi nsọ ozi), 16 ka unu onwe-unu do kwa onwe-unu n'okpuru madu di otú a, na n'okpuru onye ọ bula nke soro ayi nālukọ ọlu, onye nādọb͕u kwa onwe-ya n'ọlu. 17 Anamaṅuri kwa ọṅu n'ọbibia nke Stefanas na Fọtunetọs na Akaikọs: n'ihi na ndi ahu mezuru ihe fọduru unu imerem. 18 N'ihi na ha mere ka mọ nkem na nke unu zuru ike: ya mere mazunu madu di otú a. 19 Nzukọ Kraist nile nke di n'Esia nēkele unu. Akwila na Priska nēkele unu ọtutu ekele nime Onye-nwe-ayi, ha na nzukọ Kraist nke di n'ulo-ha. 20 Umu-nna-ayi nile nēkele unu. Werenu isutu-ọnu di nsọ kelerita ibe-unu. 21 Ekele nke mu Pọl, nke m'ji aka nkem de. 22 Ọ buru na onye ọ bula adighi-ahu Onye-nwe-ayi n'anya, ka ọ buru anathema. Onye-nwe-ayi nābia. 23 Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist diyere unu. 24 Ihu-n'anya nkem diyere unu nile nime Kraist Jisus. Amen.

2 Kọrint 1

1 Pọl, onye-ozi nke Kraist Jisus site n'ọchichọ Chineke, na Timọti nwa-nna-ayi, nēdegara nzukọ Chineke nke di na Kọrint akwukwọ, ha na ndi nsọ nile ndi nọ n'Akaia dum: 2 Amara diri unu na udo nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist puta. 3 Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, bú Nna nke obi-ebere nile na Chineke nke nkasi-obi nile; 4 Onye nākasi ayi obi na nkpab͕u-ayi nile, ka ayi we pu isite na nkasi-obi nke Chineke ji kasi ayi onwe-ayi obi kasie ndi ahu obi ndi nọ na nkpab͕u ọ bula. 5 N'ihi na dika ahuhu nile Kraist huru nābabiga ókè n'ebe ayi nọ, otú a ka nkasi-obi-ayi nābabiga kwa ókè site n'aka Kraist. 6 Ma ọ buru na anākpab͕u ayi, ọ bu n'ihi nkasi-obi-unu na nzọputa-unu; ọ buru kwa na anākasi ayi obi, ọ bu n'ihi nkasi-obi-unu, nke nālusi ọlu ike n'itachi obi n'otù ahuhu ahu nke ayi onwe-ayi nāhu kwa: 7 olile-anya-ayi bayere unu nēguzosi kwa ike; ebe ayi matara na, dika unu bu ndi nēnwekọ ahuhu nile, otú a ka unu nēnwekọ kwa nkasi-obi ahu. 8 N'ihi na, umu-nnam, ayi achọghi ka unu ghara imara ihe bayere nkpab͕u-ayi nke akpab͕uru ayi n'Esia, na esob͕uru ayi nke-uku ri nne, kari ike-ayi, ya mere ayi nwebigara obi abua ókè ma ayi gādi kwa ndu: 9 e, ayi onwe-ayi enwewo ọziza azara nime onwe-ayi na ọ bu ọnwu, ka ayi we ghara itukwasi obi n'onwe-ayi, kama ọ bu na Chineke Onye nēme ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie: 10 Onye dọputara ayi n'oké ọnwu di otú a, Ọ gādọputa kwa ayi: Onye ayi leworo anya Ya na Ọ ganādọputa kwa ayi ọzọ; 11 ebe unu nēyekọ kwa aka n'ihi ayi n'aririọ-unu; ka ọtutu madu we kele ekele n'ihi ayi bayere onyinye-amara enyeworo ayi site n'aka ọtutu madu. 12 N'ihi na inya-isi-ayi bu nka, àmà nke akọ-na-uche-ayi, na ọ bu n'idi-nsọ na idi-ọcha nke Chineke, ọ bughi n'amam-ihe nke anu-aru, kama ọ bu n'amara Chineke, ka ayi biri obi n'uwa, ma ọ bu n'ebe unu nọ ka ayi bikariri obi-ayi nke-uku. 13 N'ihi na ayi edegaraghi unu ihe ọzọ n'akwukwọ, ma-ọbughi ihe unu nāghọta ma-ọbu nke unu nāmazu kwa, anamele kwa anya na unu gāmazu ha rue ọgwugwu ihe nile: 14 dika unu mazu-kwa-ra ayi n'otù akuku, na ayi bu ihe-inya-isi-unu, ọbuná dika unu onwe-unu bu kwa ihe-inya-isi nke ayi, n'ubọchi Onye-nwe-ayi Jisus. 15 Nime ntukwasi-obi a ka m'zube-kwa-ra na mbu ibiakute unu, ka unu we nwe amara nke-abua; 16 ka m'we site kwa n'iye-aka-unu je rue Masedọnia, si kwa na Masedọnia biakute unu ọzọ, ka unu we dupukwam n'ijem iga Judia. 17 Ya mere mb͕e m'zubere nka, ọ̀ gābu na ejim uche nāgha agha zube? ma-ọbu ihe m'nēzuputa, ànamezuputa ha dika anu-aru nāgwam, ka e e na é-è é-è we di n'ọnum n'otù oge? 18 Ma dika Chineke kwesiri ntukwasi-obi, okwu-ayi nke ayi gwara unu abughi e na é-è. 19 N'ihi na Ọkpara Chineke, Jisus Kraist, Onye ekwusara n'etiti unu site n'ọnu-ayi, bú site n'ọnu nkem na nke Silvanọs na nke Timọti, emeghi Ya ka Ọ buru e na é-è, kama emewo ka e di nime Ya. 20 N'ihi na ka ha ra, bú nkwa nke Chineke, ọ bu nime Ya ka e di: n'ihi nka ka Amen site-kwa-ra n'aka-Ya, ka ewe site n'aka-ayi nye Chineke otuto. 21 Ma Onye ahu Nke nēme ka ayi na unu guzosie ike nime Kraist, Onye te-kwa-ra-ayi manu n'isi, bu Chineke; 22 Onye ka-kwa-ra ayi akàrà, nye kwa ayi Mọ Nsọ n'obi-ayi, bú ihe ayi ji mara na ayi gēnwezu nkwa ahu nile. 23 Ma mu onwem nākpọku Chineke ka Ọ buru onye-àmà megide nkpuru-obim, na ọ bu n'imere unu ebere ka m'nējighi bia Kọrint rue ub͕u a. 24 Ọ bughi na ayi bu ndi-nwe okwukwe-unu, kama ayi bu ndi soro unu nālu ọṅù-unu: n'ihi na unu ji okwukwe-unu guzo.

2 Kọrint 2

1 Ma ezuputaram onwem nka, na m'gaghi-abiakute unu ọzọ n'ihe-nwuta. 2 N'ihi na asi na mu onwem eme ka o wuta unu, ònye bu kwa onye gēme ka obi tọm utọ, ma-ọbughi onye ahu nke anēme ka o wuta ya site na mu onwem? 3 Ede-kwa-ram otù ihe nka n'akwukwọ, ka m'we ghara inwe ihe-nwuta mb͕e m'biara n'aka ndi o kwesiri ka m'ṅuria ọṅu n'aru ha; ebe m'tukwasiworo obi n'ebe unu nile nọ, na ọṅùm bu ọṅù nke unu nile. 4 N'ihi na m'sitere na nkpab͕u na ihe-nb͕u nke obi riri nne were ọtutu anya-miri degara unu akwukwọ; ọ bughi ka eme ka o wuta unu, kama ka unu we mara ihu-n'anya nke m'hubigara unu ókè kari. 5 Ma ọ buru na onye ọ bula emewo ka o wuta ayi, ọ bughi mu onwem, kama, n'otù akuku (ka m'ghara idọb͕u unu nke-uku) ọ bu unu nile ka o meworo ka o wuta. 6 O zuworo madu di otú a, bú nba nka nke ndi ka n'ọnu-ọgugu nime unu bara ya; 7 ya mere, kama ibara ya nba ọzọ anamachọ ka unu were amara b͕aghara ya kasi kwa ya obi, ka aghara iji ihe-nwuta nke nēwutabiga ya ókè loda madu di otú a n'uzọ ọ bula. 8 N'ihi nka ariọm unu ka unu me ka ihu-n'anya unu huru ya buru ihe di itukwasi obi. 9 N'ihi na ihe mere m'degara unu akwukwọ bu kwa nka, ka m'we mara nnwaputa unu, ma unu bu ndi nāṅa nti rue ihe nile. 10 Ma onye ọ bula unu were amara b͕aghara ya ihe ọ bula, mu onwem were kwa amara b͕aghara ya: n'ihi na ihe mu onwem werewo-kwa-ra amara b͕aghara, ma ọ buru na ewerewom amara b͕aghara ihe ọ bula, ọ bu n'ihi unu ka m'meworo ya n'iru Kraist; 11 ka Setan we ghara irib͕u ayi: n'ihi na ayi abughi ndi nāmaghi ihe nile ọ nēchèputa. 12 Ma mb͕e m'biaruru Troas izisa ozi ọma Kraist, mb͕e emeghereri kwa ọnu-uzọ nime Onye-nwe-ayi nyem, 13 mọm adighi nfé ma-ọli, n'ihi na ahughi m Taitọs nwa-nnam: kama ekelerem ha ekele ikpe-azu, we pua je Masedọnia. 14 Ma ekele diri Chineke, Onye nēdughari ayi n'ọṅù-agha nime Kraist mb͕e nile, nēsite kwa n'aka-ayi egosi isìsì nke ọmuma-Ya n'ebe nile. 15 N'ihi na ayi bu isìsì utọ nke Kraist n'ebe Chineke nọ, n'etiti ndi anāzọputa, na n'etiti ndi nāla n'iyì; 16 n'ebe ndia nọ ọ bu isìsì nke sitere n'ọnwu we dubà n'ọnwu; n'ebe ndi ahu anāzọputa nọ ọ bu isìsì nke sitere na ndu we dubà na ndu. Ma ònye ruru ime ihe ndia? 17 N'ihi na ayi adighi ka ọra madu, ndi were ihe nādighi nma nētigwa n'okwu Chineke: kama dika ndi sitere n'idi-ọcha, kama dika ndi sitere na Chineke, ọ bu n'iru Chineke, nime Kraist ka ayi nēkwu.

2 Kọrint 3

1 Àyi nāmalite ọzọ ime ka madu mara ayi? ma-ọbu ǹkpà akwukwọ-ozi ime ka madu mara ayi nākpa ayi inye unu ma-ọbu inara unu, dika ọ nākpa ufọdu? 2 Unu onwe-unu bu akwukwọ-ozi-ayi, nke edeworo nime obi-ayi, nke madu nile mara nāgu kwa; 3 ebe emere ka unu puta ìhè na unu bu akwukwọ-ozi Kraist, nke ayi jere ozi ya, nke anējighi ink de, kama ọ bu Mọ nke Chineke di ndu ka eji de ya; ọ bughi n'elu mbadamba nkume, kama ọ bu n'elu mbadamba ihe di iche, bú obi nke anu-aru. 4 Ntukwasi-obi di otú a ka ayi nwe-kwa-ra site n'aka Kraist n'ebe Chineke nọ: 5 ọ bughi na ayi ruru n'onwe-ayi, igu ihe ọ bula dika o sitere n'onwe-ayi; kama iru-eru-ayi sitere na Chineke; 6 Onye me-kwa-ra ayi ka ayi rue ibu ndi nēje ozi ọb͕ub͕a-ndu ọhu; ọ bughi nke ihe edeworo n'akwukwọ, kama ọ bu nke Mọ Nsọ: n'ihi na ihe ahu edeworo n'akwukwọ nēb͕u eb͕u, ma Mọ ahu nēnye ndu. 7 Ma ọ buru na ije-ozi nke ọnwu, nke edeworo n'akwukwọ, nke atuworo n'elu nkume, biara n'ebube, nke mere umu Israel apughi ilegide iru Moses anya n'ihi ebube nke iru-ya; ebube nke anēme ka ọ ghara idi irè: 8 ìje-ozi nke Mọ Nsọ gēsi aṅa ghara idi kari n'ebube? 9 N'ihi na asi na ije-ozi nke ọmuma-ikpé bu ebube, ije-ozi nke ezi omume gēnwebiga ebube ókè kari nke-uku. 10 N'ihi na ihe emeworo ka ọ di ebube, emeghi ya ka ọ di ebube n'akuku a n'ezie, n'ihi ebube ahu nke kariri nke-uku. 11 N'ihi na asi na ihe anēme ka ọ ghara idi irè ji ebube bia, ihe nādigide dikariri n'ebube nke-uku. 12 Ya mere ebe ayi nwere olile-anya di otú a, ayi nēkwuwa okwu nke-uku, 13 ayi adighi kwa ka Moses, onye nēkpudo ihe-nkpudo n'iru-ya, ka umu Israel we ghara ilegide anya rue ọgwugwu ihe ahu anēme ka ọ ghara idi irè: 14 ma emere ka uche-ha ma etili: n'ihi na rue ubọchi ta n'ọgugu ọb͕ub͕a-ndu ochie otù ihe-nkpudo ahu nādigide, ebe anēkpugheghi na anēme ya ka ọ ghara idi irè nime Kraist. 15 Ma rue ubọchi ta, mb͕e ọ bula anāgu akwukwọ Moses, ihe-nkpudo nādigide n'obi-ha. 16 Ma mb͕e ọ bula o gēchigharikute Onye-nwe-ayi, ewepu ihe-nkpudo ahu. 17 Ma Onye-nwe-ayi bu Mọ ahu: ma ebe Mọ nke Onye-nwe-ayi nọ, n'ebe ahu ka madu nwere onwe-ha. 18 Ma ayi onwe-ayi nile ebe ayi were iru nke ekpupuworo ihe-nkpudo nēgosi ebube nke Onye-nwe-ayi dika enyo, anēnwogha ayi rue n'otù onyinyo ahu site n'ebube rue ebube, ọbuná dika anēnye ya site n'Onye-nwe-ayi, bú Mọ Nsọ.

2 Kọrint 4

1 N'ihi nka, ebe ayi nwere ije-ozi a, dika emere ayi ebere, ike agwughi ayi n'obi: 2 kama ayi juru ihe-nzuzo nile nke nēweta ihere, ayi adighi-ejeghari n'aghughọ, ayi adighi-emeso kwa okwu Chineke n'uzọ itu-ntu; kama ayi ji ngosi nke ezi-okwu nēme ka akọ-na-uche nke madu nile n'otù n'otù mara ayi n'iru Chineke. 3 Ma asi kwa na ekpudoworo ozi ọma ayi ihe, ọ bu n'etiti ndi nāla n'iyì ka ekpudoworo ya: 4 ndi chi nke oge a mere ka anya nke uche nke ndi nēkweghi ekwe kpu ìsì n'etiti ha, ka inye-ìhè nke ozi ọma nke ebube Kraist, Onye bu onyinyo Chineke, we ghara iwakwasi ha. 5 N'ihi na ọ bughi ayi onwe-ayi ka ayi nēkwusa, kama ọ bu Kraist Jisus, na Ọ bu Onye-nwe-ayi, ayi nāsi kwa na ayi onwe-ayi bu ndi-orù-unu n'ihi Jisus. 6 N'ihi na ọ bu Chineke, Onye siri, Ìhè gēsi nime ọchichiri nwuputa, bu Onye nwubàra nime obi-ayi, iweta inye-ìhè nke ọmuma nke ebube nke Chineke n'iru nke Jisus Kraist. 7 Ma ayi nwere àkù a n'ite ájá, ka ọkika nke ike ahu we buru nke Chineke, ghara kwa isite n'ayi onwe-ayi; 8 anākpab͕u ayi n'akuku nile, ma adighi-akpab͕ubiga ayi ókè; ayi nwere obi abua, ma ayi adighi-enwebiga obi abua ókè; 9 anēsob͕u ayi, ma adighi-arapu nání ayi; anātuda ayi n'ala, ma adighi-ala ayi n'iyì; 10 ayi nēbughari n'aru-ayi mb͕e nile ob͕ub͕u nke Jisus, ka ewe me kwa ka ndu nke Jisus puta ìhè n'aru-ayi. 11 N'ihi na arara ayi onwe-ayi, bú ndi di ndu, nye n'aka ọnwu mb͕e nile n'ihi Jisus, ka ewe me kwa ka ndu nke Jisus puta ìhè n'anu-aru-ayi nke puru inwu anwu. 12 Ya mere ọnwu nālusi ọlu ike nime ayi, ma ndu nālusi ọlu ike nime unu. 13 Ma ebe ayi nwere otù mọ nke okwukwe ahu, dika ihe edeworo n'akwukwọ nsọ si di, Ekwerem, n'ihi ya ka m'kwuru; ayi onwe-ayi kwere kwa, ọ bu kwa n'ihi ya ka ayi nēkwu; 14 ebe ayi matara na Onye ahu Nke mere ka Onye-nwe-ayi Jisus si n'ọnwu bilie, na Ọ gēme kwa ka ayi so Jisus si n'ọnwu bilie, Ọ gēche kwa ayi na unu n'iru Onwe-ya. 15 N'ihi na ihe nile di n'ihi unu, ka amara, ebe o riri nne site n'aka ndi ka n'ọnu-ọgugu, ka o we me ka ikele-ekele babiga ókè rue ebube nke Chineke. 16 N'ihi nka ike agwughi ayi n'obi; kama asi na ọ bu ezie na madu elu-aru ayi nēre uré, ma anēme ka madu ime ayi buru ihe ọhu kwa-ubọchi. 17 N'ihi na nkpab͕u-ayi nke di nfé, nke di na nwa oge a, nāluputara ayi ebube nke-uku ri nne kachasi ihe nile, bú ebube nke di arọ́ di kwa ebighi-ebi; 18 ebe ayi nādighi-ele ihe anāhu anya, kama ihe anādighi-ahu anya: n'ihi na ihe anāhu anya nādiru nwa oge; ma ihe anādighi-ahu anya di ebighi-ebi.

2 Kọrint 5

1 N'ihi na ayi matara na asi na akwaturu ulo nke uwa, bú ulo-ikwū-ayi, ayi nwere ulo ewuru nke sitere na Chineke, ulo anējighi aka wu, di ebighi-ebi, n'elu-igwe. 2 N'ihi na ayi nāsu udè nime ulo nka ezie, ebe ọ nāgusi ayi ike ka ewere ebe-obibi-ayi nke sitere n'elu-igwe yikwasi ayi n'elu ya: 3 ebe ọ bu na agāhu ayi ndi eyiworo ihe, ndi nāb͕aghi ọtọ. 4 N'ihi na ayi, bú ndi nọ n'ulo-ikwū a, ayi nāsu udè ezie, ebe ọ nānyib͕u ayi; n'ihi na ayi achọghi ka eyipu ayi ya, kama ka eyikwasi ayi ihe n'elu ya, ka ndu we loda ihe puru inwu anwu. 5 Ma Onye luputara ayi ka ewe me otù ihe a bu Chineke, Onye nyere ayi Mọ Nsọ, bú ihe ayi ji mara na agēmezuru ayi ya. 6 Ya mere ayi nēnwe obi-ike mb͕e nile, mata kwa na mb͕e ayi nọ n'ulo n'aru-ayi, ayi anọghi n'ulo n'ebe Onye-nwe-ayi nọ: 7 (n'ihi na ayi sitere n'okwukwe nējeghari, ọ bughi n'ọhuhu-uzọ); 8 ayi nēnwe obi-ike, ka m'kwuru, ọ di kwa ayi ezi nma kari ka ayi ghara inọ n'ulo n'aru-ayi, ka ayi nọ kwa n'ulo n'ebe Onye-nwe-ayi nọ. 9 N'ihi nka ayi nējisi kwa ike ka ayi we buru ndi di Ya ezi utọ, ma ayi nọ n'ulo ma-ọbu na ayi anọghi n'ulo. 10 N'ihi na aghaghi ime ka ayi nile puta ìhè n'iru oche-ikpé Kraist; ka ayi nile n'otù n'otù we nāghachi íhe esitere n'aru me, dika ihe onye ọ bula mere si di, ma ọ bu ezi ihe ma-ọbu ihe nādighi nma. 11 Ya mere ebe ayi matara egwu Onye-nwe-ayi, ayi nēme ka madu kweye, ma emewo ka ayi puta ìhè nye Chineke; anamatukwasi kwa obi na emewo ka ayi puta kwa ìhè nime akọ-na-uche-unu. 12 Ayi adighi-eme ọzọ ka unu mara ayi, kama ayi nēkwu dika ndi nēnye unu oghere inya isi n'ihi ayi, ka unu we nwe ihe iza ndi nānya isi n'ihe anāhu anya, ọ bughi kwa n'obi. 13 N'ihi na asi na ayi buru ndi anya nādighi nma, ọ bu n'ebe Chineke nọ; asi kwa na ayi nwere uche zuru okè, ọ bu n'ebe unu nọ. 14 N'ihi na ihu-n'anya Kraist nērugide ayi; ebe ayi nātule nka, na otù Onye nwuru n'ọnọdu madu nile, ya mere madu nile nwuru; 15 Ọ nwu-kwa-ra n'ọnọdu madu nile, ka ndi di ndu we ghara idiri onwe-ha ndu ọzọ, kama ka ha diri Onye ahu ndu, bú Onye nwuru n'ọnọdu ha, eme kwa ka O si n'ọnwu bilie. 16 Ya mere ayi onwe-ayi amataghi onye ọ bula site n'ub͕u a dika anu-aru nāmata: ọbuná asi na ayi amawo Kraist dika anu-aru mara, ma ub͕u a ayi amaghi Ya ọzọ otú a. 17 Ya mere ọ buru na onye ọ bula di nime Kraist, ọ bu onye ekère ọhu: ihe ochie agasiwo; le, ha aghọwo ihe ọhu. 18 Ma ihe nile sitere na Chineke, Onye sitere n'aka Kraist me ka ayi na Ya onwe-ya di n'otù, O we nye ayi ije-ozi nke ime-ka-adi-n'otú ahu; 19 nke bu na Chineke nọri nime Kraist nēme ka Ya onwe-ya na uwa di n'otù, nāgughi ndahie nile ha megide ha, O debe-kwa-ra nime ayi okwu nke ime-ka-adi-n'otù ahu. 20 Ya mere ayi bu ndi-ukọ̀ n'ọnọdu Kraist, dika agāsi na Chineke nāriọ aririọ site n'aka-ayi: ayi nọ n'ọnọdu Kraist nāriọ unu, menu ka unu na Chineke di n'otù. 21 Onye ahu Nke nāmaghi nmehie ka O mere ka Ọ buru nmehie n'ọnọdu ayi; ka ayi onwe-ayi we ghọ ezi omume Chineke nime Ya.

2 Kọrint 6

1 Ma, dika ndi ayi na Ya nālukọ ọlu, ayi nāriọ kwa unu ka unu ghara inara amara Chineke n'efu, 2 (n'ihi na Ọ nāsi, N'oge anānara madu nke-ọma ka M'nuru olu-gi, Ọ bu kwa n'ubọchi nzọputa ka M'yere gi aka: le, ub͕u a bu oge anānara madu nke-ọma; le, ub͕u a bu ubọchi nzọputa): 3 ayi adighi-eme ihe-isu-ngọngọ ọ bula n'ihe ọ bula, ka aghara ita ije-ozi-ayi uta; 4 kama n'ihe nile ayi nēme ka madu mara ayi, dika ndi nējere Chineke ozi, nime oké ntachi-obi, nime nkpab͕u, nime nkpà, nime oké nkpà, 5 nime ihe-otiti, nime ulo-nkpọrọ, nime aghara, nime idọb͕u onwe-ayi n'ọlu, nime imuru-anya, nime obubu-ọnu; 6 nime idi-ọcha, nime ihe-ọmuma, nime ogologo ntachi-obi, nime obi-ọma, nime Mọ Nsọ, nime ihu-n'anya nke iru-abua nādighi ya, 7 nime okwu nke ezi-okwu, nime ike nke Chineke; site n'ihe-agha nke ezi omume n'aka-nri na aka-ekpe, 8 site n'otuto na ihe-ihere, site na nhota ọjọ na nhota ọma; dika ndi-nduhie, ma ayi bu ndi ezi-okwu; 9 dika ndi anāmaghi aha-ha, ma amazuru ayi; dika ndi nānwu anwu, ma le, ayi di ndu; dika ndi anēme ka ha muta ihe site n'ahuhu, ma adighi-eme ka ayi nwua; 10 dika ndi ihe nēwuta, ma ayi nāṅuri ọṅu mb͕e nile; dika ndi-ob͕eye, ma ayi nēme ka ọtutu madu buru ọgaranya; dika ndi nēnweghi ihe, ma ayi nēnwezu ihe nile. 11 Ndi Kọrint, ọnu-ayi ghere oghe igwawa unu okwu, emewo ka obi-ayi di obodobo. 12 Adighi-eme ka unu nọ n'ọnọdu di oké nkpà nime ayi, ma anēme ka unu nọ n'ọnọdu di oké nkpà n'obi nke unu. 13 Ma dika ugwọ-ọlu n'otù uzọ ahu (anamekwu dika anāgwa umum), ka eme kwa ka unu onwe-unu di obodobo n'obi-unu. 14 Unu na ndi nēkweghi ekwe ekekọtala onwe-unu, n'ihi na unu na ha di iche: n'ihi na òle nkekọ ezi omume na imebi-iwu nēkekọ? ma-ọbu òle nnwekọ ìhè na ọchichiri nēnwekọ? 15 Ọzọ, òle nnwekọ-otù-olu Kraist na Belial nēnwekọ? ma-ọbu òle òkè onye kwere ekwe na onye nēkweghi ekwe nēkerita? 16 Ọzọ, òle nkwekọ ulo nsọ nke Chineke na arusi nēkwekọ? n'ihi na ayi onwe-ayi bu ulo nsọ nke Chineke di ndu; dika Chineke kwuru, si, M'gēbi nime ha, nējeghari kwa nime ha; M'gābu kwa Chineke nke ha, ha onwe-ha gābu kwa ndi nkem. 17 N'ihi nkaSinu n'etiti ha puta, guzo-kwa-nu iche, ka Onye-nwe-ayi kwuru, Unu emetu-kwa-la ihe nādighi ọcha aka; Mu onwem gākpọbata kwa unu, 18 Buru kwa unu Nna, Unu onwe-unu gābu-kwa-ram umu-ndikom na umu-ndinyom, ka Onye-nwe-ayi kwuru, Nke puru ime ihe nile.

2 Kọrint 7

1 Ya mere ndi m'huru n'anya, ebe ayi nwere nkwa ndia, ka ayi sachapu n'onwe-ayi nmeru nile nke aru na nke mọ, nēmezu idi-nsọ n'egwu Chineke. 2 Nyenu ayi uzọ n'obi-unu; ayi emeghi onye ọ bula ajọ omume, ayi emebighi onye ọ bula, ayi erib͕ughi onye ọ bula. 3 Ọ bughi ima unu ikpé ka m'nēkwu ya: n'ihi na ekwuwom ya na mbu, na unu di ayi n'obi inwukọ ọnwu na idikọ ndu. 4 Nkwuwa-okwum di uku, bú nke m'ji agwa unu okwu, inya-isim n'ihi unu di uku: nkasi-obi ezuwo ezu nimem, anamaṅuribiga ókè kari na nkpab͕u-ayi nile. 5 N'ihi na mb͕e ayi bia-kwa-ra na Masedọnia, anu-aru-ayi adighi nfé ma-ọli, kama anākpab͕u ayi n'akuku nile; ilu-ọ̀gù di n'èzí, egwu di nime. 6 Otú ọ di, Onye ahu Nke nākasi ndi di ala obi, bú Chineke, were ọbibia Taitọs kasi ayi obi; 7 ọ bighi kwa nání ọbibia-ya, kama O were kwa nkasi-obi nke ejiri kasi ya obi n'aru unu we kasi ayi obi, mb͕e ọ nākọrọ ayi ọgugu m'gusiri unu ike, iru-újú-unu, ekworo unu kworom; ya mere m'ṅuriri ọṅu kari. 8 N'ihi na asi na ọ bu ezie na ejim akwukwọ-ozim me ka o wuta unu, akwaghm uta, asi na ọ bu ezie na anamakwari uta; n'ihi na anamahu na akwukwọ-ozi ahu mere ka o wuta unu, ma asi na ọ bu ezie na ọ bu nání otù oge hour ka o wutara unu. 9 Ub͕u a anamaṅuri ọṅu, ọ bughi na emere ka ihe wuta unu, kama na emere ka o wuta unu rue nchèghari: n'ihi na emere ka o wuta unu dika Chineke chọrọ, ka unu we ghara isite n'ayi yi iyì n'ihe ọ bula. 10 N'ihi na nwuta dika Chineke chọrọ nālu ọlu nchèghari rue nzọputa, bú nchèghari nke anāpughi ikwa uta bayere ya: ma nwuta nke uwa nāluputa ọnwu. 11 N'ihi na le, otù ihe a, na emere ka ihe wuta unu dika Chineke chọrọ, le ka ọ ra, bú inu-ọku-n'obi ọ luputara nime unu, e, le ka ngọpu ra, e, le ka iwe uku ra, e, le ka egwu ra, e, le ka ọgugu m'gusiri unu ike ra, e, le ka ekworo ra, e, le ka nkpeputa ra! N'ihe nile ọ bula unu mere ka amara unu na unu di ọcha n'okwu ahu. 12 Ya mere asi na ọ bu ezie na edegaram unu akwukwọ, ọ bughi n'ihi onye ahu mere ajọ omume ka m'dere ya, ọ bughi kwa n'ihi onye ahu emere ajọ omume megide ya, kama ka ewe me ka inu-ọku-n'obi unu nānu n'ihi ayi putara unu ìhè n'iru Chineke. 13 N'ihi nka akasiwo ayi obi: ma na nkasi-obi-ayi ayi ṅuribigara ókè nke-uku kari n'ihi ọṅù Taitọs, n'ihi na emewo ka mọ-ya zuru ike site n'ebe unu nile nọ. 14 N'ihi na asi na ọ di ihe m'nyaworo ya isi bayere unu, emeghi ka ihere mem; kama dika ayi gwara unu ihe nile n'ezi-okwu, otú a ka esi hu kwa na inya-isi-ayi, nke m'nyara n'iru Taitọs, bu ezi-okwu. 15 Obi-ya dibigara ókè n'ebe unu nọ, mb͕e ọ nēcheta iṅa-nti nke unu nile, otú unu were egwu na ima-jijiji nara ya nke-ọma. 16 Anamaṅuri ọṅu na enwerem obi-ike n'ihe nile n'aru unu.

2 Kọrint 8

1 Ọzọ, umu-nnam, ayi nēme ka unu mara amara Chineke nke enyeworo nime nzukọ Kraist nile nke Masedọnia; 2 na nime ọtutu nnwaputa nke nkpab͕u, nbabiga-ókè nke ọṅù-ha na ob͕eye-ọnu-ntu ha bu babigara ókè rue àkù nke afọ-ofufo-ha. 3 N'ihi na ka ike-ha ra, dika m'nāb͕a àmà, e, kari kwa ike-ha, ka ha nyere dika ha zuputara n'onwe-ha, 4 ha were ọtutu aririọ nāriọ ayi ka ayi nye ha amara nka na nnwekọ ije-ozi anējere ndi nsọ: 5 ha me-kwa-ra nka, ọ bughi dika ayi lere anya, kama ha buru uzọ were onwe-ha nye Onye-nwe-ayi, nye kwa ayi site n'ọchichọ Chineke. 6 Ya mere ayi riọrọ Taitọs, ka, dika ọ malitereri na mbu, ka ọ luzu kwa n'etiti unu amara nka otú a kwa. 7 Ma dika unu babigara ókè n'ihe nile, bú okwukwe, na okwu, na ihe-ọmuma, na inu-ọku-n'obi nile, na ihu-n'anya unu huru ayi, lezienu anya ka unu babiga kwa ókè n'amara nka. 8 Ekwughm n'uzọ inye iwu, kama n'iwere inu-ọku-n'obi nke ndi ọzọ nwaputa kwa ihu-n'anya-unu na ọ bu ezi ihu-n'anya. 9 N'ihi na unu mara amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na, ọ bu ezie na Ọ bu ọgaranya, ma Ọ ghọrọ ob͕eye n'ihi unu, ka unu onwe-unu we were ob͕eye-Ya ghọ ndi-ọgaranya. 10 Na nka ka m'nēnye kwa ìzùm: n'ihi na nka nābara unu urù, madu ndi buru uzọ malite n'arọ gara aga, ọ bughi nání ime eme, kama ichọ kwa achọ. 11 Ma ub͕u a mezu-kwa-nu omume ahu; ka, dika obi di ọku ichọ achọ diri unu, ka ewe site n'ihe unu nwere mezu kwa ya otú a. 12 N'ihi na asi na obi di ọku di ya, ọ bu ihe agānara nke-ọma dika ihe ọ bula madu nwere si di, ọ bughi dika ihe ọ nēnweghi. 13 N'ihi na ekwughm nka, ka o we di ndi ọzọ nfé, ka nkpab͕u we di-kwa-ra unu: 14 kama anamekwu n'uzọ nrata; ebe ihe unu nwebigara ókè mejuru ihe fọduru ha inwe n'oge di ub͕u a, ka ihe ndi ahu nwebigara ókè we meju kwa ihe fọduru unu inwe; ka nrata we di: 15 dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye chikọtara ri nne enweghi kari nke gēzuru ya; onye chikọta-kwa-ra ntà, ọ dighi ihe fọduru ya inwe. 16 Ma ekele diri Chineke, Onye nētiye otù inu-ọku ahu n'ihi unu n'obi Taitọs. 17 N'ihi na ọ nara aririọ-ayi nke-ọma n'ezie; ma ebe ọ nānu ọku n'obi kari ihe m'chère, o siri n'ebe a pua jekuru unu dika o zuputara n'onwe-ya. 18 Ayi ezìkọwo kwa ya na nwa-nna-ayi ahu onye otuto-ya n'ozi ọma ayi ruzuru nzukọ Kraist nile; 19 ma ọ bughi nání otú a, kama nzukọ Kraist nile rọputa-kwa-ra ya ka ọ nēso ayi n'ije ije n'amara nka, nke ayi nēje ozi ya inye Onye-nwe-ayi otuto, na igosi obi di ọku nke ayi: 20 ma ayi nēze nka, ka onye ọ bula ghara ita ayi uta n'oké onyinye-amara nka nke ayi nēje ozi ya: 21 n'ihi na ayi buru uzọ nēchè ihe ọma, ọ bughi nání n'iru Onye-nwe-ayi, kama n'iru madu kwa. 22 Ayi ezìkọwo kwa ha na nwa-nna-ayi, onye ayi nwaputara ọtutu mb͕e na ọ nānu ọku n'obi n'ọtutu ihe, ma ub͕u a ọ nānu kari ọku n'obi nke-uku, site n'oké ntukwasi-obi nke ọ nātukwasi n'aru unu. 23 Ma ọ buru na onye ọ bula aju ajuju bayere Taitọs, ọ bu onye mu na ya nēnwekọ ihe, buru kwa onye mu na ya nālukọrọ unu ọlu; ma-ọbu umu-nna-ayi, ha bu ndi-ozi nke nzukọ Kraist, ha bu otuto nke Kraist. 24 Ya mere nēgosinu ha n'iru nzukọ Kraist nile ihe gēgosi ihu-n'anya-unu na inya-isi-ayi bayere unu.

2 Kọrint 9

1 N'ihi na ọ dighi nkpà ka m'degara unu akwukwọ bayere ijere ndi nsọ ozi: 2 n'ihi na amataram obi di ọku unu, nke m'nānyara ndi Masedọnia isi bayere unu, na Akaia akwadebewo n'arọ gara aga; inu-ọku-unu kwali-kwa-ra obi ndi ka n'ọnu-ọgugu nime ha. 3 Ma ezitewom umu-nna-ayi, ka ewe ghara ime inya-isi ayi nānya bayere unu ka ọ buru ihe-efu n'akuku a; ka unu we buru ndi nọ na nkwadebe, dika m'nēkwuri: 4 ka ewe ghara ime ka ihere me ayi onwe-ayi n'uzọ ọ bula (ka ayi ghara isi, unu onwe-unu) n'ihe a nke ayi dabere, ma asi na ndi Masedọnia gēsom bia, we hu na unu akākwadebeghi. 5 Ya mere agurughi m na ọ di nkpà iriọ umu-nna-ayi, ka ha buru uzọ jekuru unu, buru kwa uzọ me ka ihe-ngọzi ahu nke unu buru uzọ kwe na nkwa zu okè, ka ihe ahu we buru ihe edoziri, dika ihe-ngọzi, ọ bughi kwa dika ihe-nrib͕u. 6 Ma nka ka m'kwuru, Onye were aka-ntagide nāgha nkpuru gēwere kwa aka-ntagide nēwe ihe-ubi; onye were kwa ngọzi nāgha nkpuru gēwere kwa ngọzi nēwe ihe-ubi. 7 Ka onye ọ bula n'etiti unu nye dika o buru uzọ rọputa n'obi-ya; ọ bughi site na nwuta, ma-ọbu site na nkpà: n'ihi na Chineke huru onye were obi-utọ nēnye n'anya. 8 Ma Chineke puru ime ka amara nile babigara unu ókè; ka unu we babiga ókè ilu ezi ọlu nile ọ bula, ebe unu nwezuru ihe nile nākpa unu n'uzọ ọ bula mb͕e nile: 9 dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ọ ghasara àkù-ya, o nyere ndi-ob͕eye ihe; Ezi omume-ya nānọgide rue mb͕e ebighi-ebi. 10 Ma Onye ahu Nke nwere inyezu onye nāgha nkpuru nkpuru-ya, Onye nwe-kwa-ra inyezu madu nri ka o rie, Onye ahu gēnyezu unu nkpuru-ọghigha-unu, me kwa ka ha ba uba, Ọ gēme kwa ka nkpuru ezi omume-unu rie nne kari: 11 ebe anēme ka unu buru ọgaranya n'ihe nile ọ bula rue afọ-ofufo nile, nke sitere n'aka-ayi nāluputa ekele anēkele Chineke. 12 N'ihi na ije-ozi nke ifè-òfùfè a abughi nání ihe nēmezu ihe fọduru ndi nsọ inwe, kama o site-kwa-ra n'ọtutu ekele anēkele Chineke we babiga ókè; 13 ebe ha ji nnwaputa nke ije-ozi a nēnye Chineke otuto n'ihi na edoro nkwuputa-unu n'okpuru ozi ọma Kraist, ya na n'ihi afọ-ofufo nke nnwekọ unu nēme ka ha na madu nile so unu nēnwekọ; 14 ha onwe-ha kwa, n'aririọ-ha n'ihi unu, nāgusi unu ike n'ihi amara Chineke di nime unu nke kariri nke-uku. 15 Ekele diri Chineke n'ihi onyinye-Ya nke anāpughi ikọ akukọ ya.

2 Kọrint 10

1 Ma mu onwem Pọl ji idi-nwayọ na obi-ọma nke Kraist nāriọ unu, mu onye nādi ala n'iru unu mb͕e m'nọ n'etiti unu, ma mb͕e m'nānọghi enwem obi-ike n'ebe unu nọ: 2 ma ariọm unu, ka m'ghara inwe obi-ike mb͕e m'nọ n'etiti unu na ntukwasi-obi ahu nke m'nāgu na m'gēji nwe anya-ike imegide ufọdu, ndi nāgu ayi dika ndi nējeghari dika anu-aru-ayi si chọ. 3 N'ihi na ọ bu ezie na ayi nējeghari n'anu-aru, ma ayi adighi-ebu agha dika anu-aru si ebu: 4 (n'ihi na ihe-agha nke ibu-agha-ayi abughi nke anu-aru, kama ha sitere na Chineke bu ihe puru ikwada ebe ewusiri ike); 5 ebe ayi nēweda ihe anātule n'obi, na ihe nile ọ bula di elu nke eweliri elu imegide ọmuma Chineke, ayi nādọta kwa ihe nile ọ bula anēchèputa n'agha iṅa nti Kraist; 6 ayi nānọ kwa dika ndi edoziworo ikpeputa aṅaghi-nti nile n'ìhè, mb͕e ọ bula agēmezu iṅa-nti-unu. 7 Unu nēle ihe di n'iru unu anya. Ọ buru na onye ọ bula atukwasiwo obi n'onwe-ya na ya bu onye Kraist, ya gua nka ọzọ n'onwe-ya, na, dika ya onwe-ya bu onye Kraist, otú a ka ayi onwe-ayi bu kwa. 8 N'ihi na asi na ọ bu ezie na m'gānyabiga isi ókè kari bayere ike-ayi (nke Onye-nwe-ayi nyere iwuli unu elu dika ulo, ọ bughi kwa iweda unu), agaghi-eme ka ihere mem: 9 ka m'we ghara idi unu ka agāsi na ejim akwukwọ-ozim nile me ka unu tua oké egwu. 10 N'ihi na ha nāsi, Akwukwọ-ozi-ya di arọ́ di kwa ike; ma ọnunọ nke aru-ya n'etiti ayi adighi ike, okwu-ya bu kwa ihe akpọrọ ihe-efu. 11 Ka madu di otú a gua nka, na aha madu ayi ji akwukwọ-ozi buru n'okwu mb͕e ayi nānọghi n'etiti unu, madu di otú a ka ayi bu kwa n'ọlu mb͕e ayi nọ n'etiti unu. 12 N'ihi na ayi enweghi anya-ike igu onwe-ayi n'etiti ufọdu, ma-ọbu iwere onwe-ayi tule ha, bú ufọdu ndi ahu ndi ha onwe-ha nēme ka amara ha: ma ebe ha nēwere onwe-ha tù onwe-ha, were kwa onwe-ha tule onwe-ha, ha onwe-ha aghọtaghi ihe. 13 Ma ayi onwe-ayi agaghi-anya isi rue ihe anāpughi itù atù, kama dika ọtùtù nke ihe-ọtùtù ahu si di, bú nke Chineke keputara ayi, dika ọtùtù, ibiaru ọbuná n'ebe unu nọ. 14 N'ihi na ayi esetibigaghi onwe-ayi ókè, dika agāsi na ayi adighi-eru unu: n'ihi na ayi bu ndi buru uzọ biakute unu nime ozi ọma Kraist: 15 ayi adighi-anya isi rue ihe anāpughi itù atù, nke ahu bu, na ndọb͕u ndi ọzọ dọb͕uru onwe-ha n'ọlu; ma ayi nēle anya na, mb͕e okwukwe-unu nāba uba kari, agēme ka ayi di uku n'etiti unu dika ihe-ọtùtù-ayi si di rue ibabiga-ókè, 16 ka ayi we zisa ozi ọma rue ebe nile di n'ofè unu, ghara kwa inya isi bayere ihe edoziri ayi n'ihe-ọtùtù onye ọzọ. 17 Ma onye nānya isi, ya nya n'Onye-nwe-ayi. 18 N'ihi na onye ya onwe-ya nēme ka amara ya, ọ bughi onye ahu ka anwaputaworo, kama ọ bu onye Onye-nwe-ayi nēme ka amara ya.

2 Kọrint 11

1 Ọ gādim nọ̄ nma ma ọ buru na unu gānagidem n'okwu ntà nke sitere n'enweghi-uche: ma unu nānagidem n'ezie. 2 N'ihi na ejim ekworo Chineke nēkworo unu: n'ihi na ejikọrọm unu na otù di, ka m'we che unu n'iru Kraist dika nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú nke anēmerughi. 3 Ma anamatu egwu, ma ọ nwere uzọ ọ bula agēmebi uche-unu ka unu pua n'afọ-ofufo na idi-ọcha nke di n'ebe Kraist nọ, dika agwọ ahu were aghughọ-ya ghọb͕ue Iv. 4 N'ihi na asi na onye ahu nke nābia nēkwusa Jisus ọzọ, onye ayi nēkwusaghi, ma-ọbu asi na unu nānara mọ di iche, nke unu nānaraghi, ma-ọbu ozi ọma di iche, nke unu nānaraghi nke-ọma, unu nānagide ya nke-ọma. 5 N'ihi na anamagu na ọ dighi uzọ ọ bula m'nērughi ndi kachasi elu n'etiti ndi-ozi. 6 Ma asi na ọ bu ezie na abum onye nāmutaghi akwukwọ n'uzọ ikwu okwu, ma abughi m otú a n'uzọ ihe-ọmuma; kama ayi mere ka ọ puta ìhè nye unu n'ihe nile ọ bula n'etiti madu nile. 7 Ma-ọbu ọ̀ bu nmehie ka m'mehiere, mb͕e m'wedara onwem n'ala ka ewe welie unu onwe-unu elu, n'ihi na ezirim unu ozi ọma nke Chineke n'onyinye-efu? 8 Anapurum ihe n'aka nzukọ Kraist ọzọ, nānara ha ego-ọlu ka m'we jere unu ozi; 9 mb͕e m'nọ-kwa-ra n'etiti unu, nọ kwa na nkpà, abughi m onye ọ bula ibu arọ́; n'ihi na umu-nna-ayi, mb͕e ha si na Masedọnia bia, ha mezuru ihe nke fọdurum inwe; edebe-kwa-ram onwem n'uzọ nile ọ bula ka m'ghara inyib͕u unu, otú a ka m'gēdebe kwa onwem. 10 Dika ezi-okwu nke Kraist di nimem, agaghi-eb͕ochi inya-isi a nimem n'akuku nile nke Akaia. 11 N'ìhi gini? ọ̀ bu n'ihi na ahughi m unu n'anya? Chineke matara. 12 Ma ihe m'nēme ka m'gēme kwa, ka m'we bipuru ndi nāchọ ihe ha gēji megidem ihe ahu ha ji megidem; ha ewe hu na ha di kwa ka ayi onwe-ayi n'ihe ha nānya isi. 13 N'ihi na madu di otú a bu ndi-ozi ugha, ndi-ọlu nātu ntu, ndi nēme onwe-ha ka ha yie ndi-ozi Kraist. 14 Ọ bughi kwa ihe iju anya; n'ihi na Setan onwe-ya nēme onwe-ya ka o yie mọ-ozi nke ìhè. 15 Ya mere ọ bughi ihe uku ma asi na ndi nējere ya ozi nēme kwa onwe-ha ka ha yie ndi nēje ozi ezi omume; ndi ọgwugwu-ha gādi ka ọlu-ha si di. 16 Asim ọzọ, Ka madu ọ bula ghara ichè na abum onye nēnweghi uche: ma ọ buru na unu emeghi otú a, otú ọ di naranum nke-ọma dika onye nēnweghi uche, ka mu onwem we nya kwa isi nke-ntà. 17 Ihe m'nēkwu, ekwughi m dika Onye-nwe-ayi gēkwu, kama ọ bu dika n'enweghi-uche, n'ihe m'dabere we nānya isi. 18 Ebe ọtutu madu nānya isi n'uzọ anu-aru, mu onwem gānya kwa isi. 19 N'ihi na unu were obi-utọ nānagide ndi nēnweghi uche, ebe unu nwere uche. 20 N'ihi na unu nānagide ya, ma ọ buru na onye ọ bula eme ka unu buru orù, ọ buru na onye ọ bula eripia unu, ọ buru na onye ọ bula ejide unu, ọ buru na onye ọ bula eweli onwe-ya elu, ọ buru na onye ọ bula apia unu ihe n'iru. 21 Anamekwu okwu bayere ebubo ihere eboro ayi, dika nka, na ayi onwe-ayi bu ndi nādighi ike. Ma n'uzọ ọ bula onye ọ bula nwere anya-ike (ọ bu n'enweghi-uche ka m'nēkwu), mu onwem nwe-kwa-ra anya-ike. 22 Hà bu ndi-Hibru? mu onwem bu kwa. Hà bu ndi Israel? mu onwem bu kwa. Hà bu nkpuru Abraham? mu onwem bu kwa. 23 Hà bu ndi nējere Kraist ozi? (anamekwu dika onye anya nādighi nma) mu onwem nēje kari; anamadọb͕ubiga onwem ókè n'ọlu kari, anamanọbiga ókè n'ulo-nkpọrọ kari, anāpiam utari nke-uku ri nne, anọm n'ọnu ọnwu ọtutu mb͕e. 24 Ub͕ò ise ka ndi-Ju piaram otù adighi n'ọgu ube-utari abua. 25 Ub͕ò atọ ka apiaram utari, otù ub͕ò ka aturum nkume, ub͕ò atọ ka ub͕ọ m'nọ nime ya kpùru, otù ubọchi abali na ehihie ka m'nọworo nime ob͕u-miri; 26 n'ije ọtutu mb͕e, n'ize-ndu site n'osimiri, n'ize-ndu site na ndi nāpunara madu ihe, n'ize-ndu site na ndi mba nkem, n'ize-ndu site na ndi mba ọzọ, n'ize-ndu nime obodo, n'ize-ndu nime ọhia, n'ize-ndu nime oké osimiri, n'ize-ndu n'etiti umu-nna ugha; 27 n'idọb͕u onwem n'ọlu na ihuju-anya, n'imu-anya ọtutu mb͕e, n'oké agu na akpiri-ikpọ-nku, n'obubu-ọnu ọtutu mb͕e, n'oyi na ib͕a-ọtọ. 28 Nāgughi ihe di n'èzí, ihe ahu di nke nānyib͕um kwa-ubọchi, bú ncheb͕u m'nēcheb͕u onwem bayere nzukọ Kraist nile. 29 Ònye nādighi ike, nke mu onwem nēsoghi ya n'adighi-ike? ònye ka anēme ka ọ ma n'ọnyà, nke mu onwem nēreghi ọku n'ihi ya? 30 Ọ buru na aghaghi m inya isi, m'gānya isi n'ihe nke diri adighi-ikem. 31 Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus, Onye bu onye agọziri agọzi rue mb͕e nile ebighi-ebi, Ọ matara na ekwughi m okwu-ugha. 32 Nime Damaskọs onye-isi ala nke nọ n'okpuru Aretas, bú eze, nēche obodo ndi Damaskọs nche, ijidem: 33 site kwa na window ka esi na mb͕idi radam n'ihe akpara akpa, m'we b͕apu n'aka-ya.

2 Kọrint 12

1 Aghaghi m inya isi, ọ bu ezie na ọ baghi urù; ma m'gēche iru n'ọhù na ihe-nkpughe nke Onye-nwe-ayi. 2 Amataram otù madu nime Kraist, arọ iri na anọ gara aga (ma ọ bu nime aru, amataghi m; ma-ọbu na ọ bughi nime aru, amataghm; Chineke matara), na eweliri madu di otú a na mberede rue elu-igwe nke-atọ. 3 Amata-kwa-ram madu di otú a (ma ọ bu nime aru, ma-ọbu na aru anọghi ya, amataghi m; Chineke matara), 4 na eweliri ya rigo na Paradais na mberede, o we nu okwu nke anāpughi ikwu, nke o nēzighi ezi n'iwu ka madu kwue ha. 5 M'ganānya isi bayere onye di otú a: ma m'gaghi-anya isi bayere mu onwem, ma-ọbughi n'adighi-ikem nile. 6 N'ihi na asi na agamachọ inya isi, m'gaghi-abu onye nēnweghi uche; n'ihi na m'gēkwu ezi-okwu: ma esepurum aka, ka onye ọ bula we ghara igu ihe bayerem kari ihe ọ huru na abum, ma-ọbu nke ọ nuru n'ọnum. 7 N'ihi ọkika nke nkpughe ndia-n'ihi ya, ka ewe ghara iwelibigam ókè, enyerem ogwu n'anu-arum, bú mọ-ozi nke Setan, ka o we tiem aka, ka ewe ghara iwelibigam ókè. 8 Ub͕ò atọ ka m'riọrọ Onye-nwe-ayi aririọ bayere ihe a, ka ọ pua n'arum. 9 Ọ siwokwam, Amaram ezuworo gi: n'ihi na emewo ka ikem zu oké n'adighi-ike. Ya mere kama ihe ọzọ m'gēwere obi-utọ nile nya isi n'adighi-ikem nile, ka ike nke Kraist we ridakwasim, biri kwa nimem. 10 N'ihi nka adighi-ike nile na imem ihe-ihere nile na nkpà nile na nsob͕u nile na oké nkpà nile n'ihi Kraist dim ezi nma: n'ihi na mb͕e ọ bula m'nādighi ike, mb͕e ahu ka m'nādi ike. 11 Aghọwom onye nēnweghi uche: unu onwe-unu rugiderem; n'ihi na ugwọ unu ji mu onwem bu ime ka amaram: n'ihi na ọ dighi uzọ ọ bula m'nērughi ndi kachasi elu n'etiti ndi-ozi, asi na ọ bu ezie na abughi m ihe ọ bula. 12 Ewere ihe-iriba-ama di iche iche na ọlu-ebube na ọlu di ike di iche iche luputa ihe-iriba-ama nile nke onye-ozi n'etiti unu ezie na ntachi-obi nile. 13 N'ìhi na gini bu ihe ahu nke emere ka unu la ala nime ya kari nzukọ Kraist fọduru, ma-ọbughi na mu onwem abughi unu ibu arọ́? b͕agharanum ajọ omume a. 14 Le, nka bu ub͕ò nke-atọ m'nọ dika onye edoziworo ibiakute unu; m'gaghi-abu kwa ibu arọ́: n'ihi na achọghi m ihe-unu, kama ọ bu unu onwe-unu: n'ihi na ọ bughi ọlu umu ikpadoro ndi muru ha ihe, kama ọ bu ọlu ndi muru umu ikpadoro umu-ha. 15 Ma mu onwem gēwere obi-utọ nile mefu ihe m'nwere kwe kwa ka emefusia mu onwem n'ihi nkpuru-obi-unu. Ọ buru na anamahubiga unu n'anya ókè kari, ànāhum n'anya nke-ntà kari? 16 Ma ka ọ di otú a, mu onwem eboghi unu ibu arọ́; kama, ebe m'bu onye-aghughọ, ejim itu-ntu nwude unu. 17 Ọ̀ gābu na esim n'aka onye ọ bula n'etiti ndi m'ziteworo unu rib͕u unu? 18 Ariọrọm Taitọs, ziga kwa nwa-nna-ayi ahu ka o so ya. Ọ̀ gābu na Taitọs rib͕uru unu n'uzọ ọ bula? àyi eweghi otù Mọ ahu jeghari? àyi esoghi n'otù ije-ukwu ahu? 19 Unu nēchè oge nile a na ayi nāgọpu onwe-ayi nye unu. Ọ bu n'iru Chineke nime Kraist ka ayi nēkwu. Ma ihe nile bu n'ihi iwuli unu elu dika ulo, ndi m'huru n'anya. 20 N'ihi na anamatu egwu, ma o nwere uzọ ọ bula, mb͕e m'gābia, m'gāhu unu ka unu nābughi aha madu ahu m'nāchọ, unu ahú kwa mu onwem ka m'nābu aha madu unu ṅachọghi; ma o nwere uzọ ọ bula esem-okwu, ekworo, ọnuma, ikpa-iche-iche, nkwutọ, ntakwu, nfuli-elu, aghara, gādi; 21 ma o nwere uzọ ọ bula, mb͕e m'gābia ọzọ, Chinekem gēwedam n'ala n'iru unu, m'ru-kwa-ra ọtutu madu újú n'etiti ndi mehieworo n'oge gara aga, ha echègharighi kwa n'adighi-ọcha na ikwa-iko na agu ikwa-iko nke ha mere.

2 Kọrint 13

1 Nka bu ub͕ò nke-atọ m'nābiakute unu. N'ọnu ndi-àmà abua ma-ọbu atọ ka agēme ka okwu nile ọ bula guzo. 2 Agwawom ha n'oge gara aga, anamebu kwa uzọ gwa ha, bú ndi mehieworo n'oge gara aga, na ndi nile fọduru, dika mb͕e m'nọ n'etiti unu ub͕ò nke-abua, ub͕u a kwa, mb͕e m'nānọghi n'etiti unu, si, na, ọ buru na abiam ọzọ, m'gaghi-eme ebere; 3 ebe unu nāchọ ihe inwaputa Kraist Onye nēkwu okwu nimem; Onye nābughi onye nādighi ike n'ebe unu nọ, kama Ọ di ike nime unu: 4 n'ihi na esitere n'adighi-ike kpọgide Ya n'obe, ma O sitere n'ike Chineke nādi ndu. N'ihi na ayi onwe-ayi bu kwa ndi nādighi ike nime Ya, ma ayi gēsite n'ike Chineke n'ebe unu nọ so Ya di ndu. 5 Nānwanu onwe-unu, ma unu di n'okwukwe-ayi; nānwaputanu onwe-unu. Ma-ọbu ùnu amazughi onwe-unu, na Jisus Kraist nọ nime unu? ma-ọbughi na ọ bu ezie na unu bu ndi ajuru aju. 6 Ma anamele anya na unu gāmara na ayi onwe-ayi abughi ndi ajuru aju. 7 Ma ayi nēkpere Chineke ka unu ghara ime ihe ọjọ ọ bula; ọ bughi ka ayi onwe-ayi we puta ìhè, na ayi bu ndi anwaputara, kama ka unu onwe-unu we nēme ihe ọma, ka ayi onwe-ayi we di kwa ka ndi ajuru aju. 8 N'ihi na ayi apughi ime ihe ọ bula megide ezi-okwu, kama ayi nēmere ezi-okwu ihe nile. 9 N'ihi na ayi nāṅuri ọṅu, mb͕e ọ bula ayi onwe-ayi nādighi ike, ma unu onwe-unu di ike: nka ka ayi nēkpe-kwa-ra Chineke, bú ka eme ka unu zu okè. 10 N'ihi nka ka m'nēde ihe ndia n'akwukwọ mb͕e m'nānọghi n'etiti unu, ka m'we ghara iwere ihe-ike meso unu mb͕e m'nọ n'etiti unu, dika ike nke Onye-nwe-ayi nyerem si di, iwuli elu dika ulo, ọ bughi kwa ikwada akwada. 11 Nke fọduru, umu-nnam, nāṅurinu ọṅu. Ka anēme unu ka unu zu okè; ka anākasi unu obi; nātukwasinu uche-unu nile n'otù ihe; nādinu n'udo: Chineke nke ihu-n'anya na udo gānọye-kwa-ra unu. 12 Werenu isutu-ọnu di nsọ kelerita ibe-unu. 13 Ndi nsọ nēkele unu. 14 Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na ihu-n'anya nke Chineke, na nnwekọ nke Mọ Nsọ, diyere unu nile.

Galetia 1

1 Pọl, onye-ozi (ọ bughi site na madu, o siteghi kwa n'aka madu, kama o sitere n'aka Jisus Kraist, site kwa n'aka Chineke, bú Nna, Onye mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie), 2 na umu-nna-ayi nile ndi mu na ha nọ, ayi nēdegara nzukọ Kraist nile nke Galetia akwukwọ: 3 Amara diri unu na udo nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist puta. 4 Onye nyere Onwe-ya n'ihi nmehie nile ayi, ka O weputa ayi n'ajọ oge nke di ub͕u a, dika ọchichọ nke Chineke, bú Nna-ayi, si di: 5 Onye otuto diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen. 6 Ọ nējum anya na unu nēsi n'aka Onye kpọrọ unu n'amara Kraist b͕abiga ọsọsọ otú a n'ozi ọma di iche; 7 nke nābughi ozi ọma ọzọ: ọ bu nání na ufọdu di ndi nēme ka obi lọ unu miri, ndi nāchọ kwa itughari ozi ọma Kraist. 8 Ma asi kwa na ayi onwe-ayi, ma-ọbu mọ-ozi nke sitere n'elu-igwe, gēzì unu ozi ọma ọzọ tukwasi ozi ọma nke ayi zìri unu, ya buru anathema (onye mmegide). 9 Dika ayi kwuworo n'oge gara aga, anamekwu kwa ya ub͕u a ọzọ, Ọ buru na onye ọ bula nēzì unu ozi ọma ọzọ tukwasi nke unu natara, ya buru anathema (onye mmegide). 10 N'ihi na ọ̀ bu madu ka m'nēme ka ha kweye ub͕u a, ma-ọbu Chineke? ma-ọbu ànamachọ uzọ ime ihe gātọ madu utọ? ọ buru na anọm nēme ihe gātọ madu utọ, m'gaghi-abuwori orù nke Kraist. 11 N'ihi na emem ka unu mara, umu-nnam, na ozi ọma m'zisara, na ọ bughi nke mmadu chèputara. 12 N'ihi na mu onwem anataghi kwa ya site na madu, ọ dighi kwa onye zírim ya, kama a nuru m site na nkpughe nke Jisus Kraist. 13 N'ihi na unu nuru ihe bayere ibi-obim n'oge gara aga n'uzọ ndi-Ju, na anamesob͕u nzukọ Chineke nke-uku ri nne, mebi kwa ya: 14 anamaga-kwa-ri n'iru n'uzọ ndi-Ju kari ọtutu ndi-ọb͕ọm n'etiti mba nkem, ebe obim nānubigara ozizí ahu ọku ókè kari, bú nke nnam-hà nyere ayi n'aka idebe. 15 Ma mb͕e ọ di Chineke ezi nma, bú Onye sitere n'oge m'nọ n'afọ nnem kewaputam, site kwa n'amara-Ya kpọm, 16 mb͕e ọ di Ya ezi nma ikpughe Ọkpara-Ya nimem, ka m'we zisa ozi ọma Ya n'etiti ndi mba ọzọ; ngwa ngwa mu na anu-aru na ọbara ab͕aghi ìzù: 17 arigoghm kwa na Jerusalem jekuru ndi burum uzọ buru ndi-ozi: kama ejerem Arebia; we laghachi na Damaskọs ọzọ. 18 Mb͕e ahu mb͕e arọ atọ gasiri arigorom na Jerusalem ileta Kifas, mu na ya we nọgide ubọchi iri na ise. 19 Ma ahughm onye ọzọ n'etiti ndi-ozi, ma ọ bu nání Jemes nwa-nne Onye-nwe-ayi. 20 Ma ihe ndia nke m'nēdegara unu, le, n'iru Chineke, na ekwughm okwu-ugha. 21 Mb͕e ahu abiarurum akuku nile Siria na Silisia. 22 Ma nzukọ nile nke Judia nke di nime Kraist nọ nāmaghi irum: 23 ma ọ bu nání na ha nānu, si, Onye ahu nke nēsob͕u ayi n'oge gara aga, ọ nēzì ozi ọma ub͕u a nke okwukwe ahu nke ọ nēmebi n'oge gara aga; 24 ha we nēnye Chineke otuto n'ihe ha huru n'arum.

Galetia 2

1 Mb͕e ahu mb͕e arọ iri na anọ gasiri arigorom na Jerusalem ọzọ, mu na Banabas, m'kpọrọ kwa Taitọs ka mu na ya yikọ je. 2 Ma arigorom n'uzọ nkpughe; m'we debe n'iru ha ozi ọma ahu nke m'nēkwusa n'etiti ndi mba ọzọ, ma edeberem ya n'iru ndi akpọrọ ihe mb͕e ha nọ iche, ka m'ghara ibu onye nāb͕a ọsọ ma-ọbu onye b͕arari ọsọ n'efu n'uzọ ọ bula. 3 Ma ọbuná Taitọs, onye mu na ya nọ, ebe ọ bu onye-Grik, erugideghi ya ka ebì ya úgwù: 4 ma n'ihi umu-nna ugha ndi ekubatarari na nzuzo, madu ndi b͕ebatara ka ha ledo inwe-onwe-ayi nke ayi nwere nime Kraist Jisus, ka ha we me ka ayi buru orù: 5 ndi ayi nēnyeghi uzọ n'uzọ ido onwe-ayi n'okpuru ha, é-è, ọ bughi otù oge hour; ka ezi-okwu nke ozi ọma we nọgide n'etiti unu. 6 Ma site n'ọnu ndi akpọrọ ihe (aha madu ha buri n'oge gara aga, o meghi ihe di iche n'anyam: Chineke adighi-ele madu anya n'iru) asim, na ndi ahu akpọrọ ihe enyeghm ìzù ọ bula: 7 kama n'akuku ọzọ, mb͕e ha huru na enyereri ozi ọma nke ndi ebìghi-úgwù n'akam na ntukwasi-obi idebe, dika enyereri Pita ozi ọma nke ndi obibi-úgwù n'aka idebe 8 (n'ihi na Onye lusiri Pita ọlu ike ka ọ we lua ọlu onye-ozi nke ndi obibì-úgwù, Onye ahu lusikwara m ọlu ike ka m'we jekuru ndi mba ọzọ); 9 mb͕e ha hukwara amara enyerem, Jemes na Kifas na Jọn, bú ndi akpọrọ ide, nara mu na Banabas aka-nri nke nnwekọ, ka ayi onwe-ayi we jekuru ndi mba ọzọ, ka ha onwe-ha we jekuru kwa ndi obibì-úgwù; 10 ọ bu nání na ha chọrọ ka ayi cheta ndi-obeye; nke m'nuru ọku n'obi ime otù ihe ahu. 11 Ma mb͕e Kifas biaruru Antiọk, eguzogiderem ya n'iru, n'ihi na ọ nọ n'ọmuma-ikpé. 12 N'ihi na mb͕e madu ufọdu akēsighi n'ebe Jemes nọ bia, ya na ndi mba ọzọ nērikọ ihe: ma mb͕e ha biara, o wezugabara we kewapu onwe-ya, ebe ọ nātu egwu ndi obibì-úgwù. 13 Ndi-Ju fọduru we so ya n'inwe kwa iru-abua; nke mere ka iru-abua-ha dọrọ Banabas onwe-ya iso ha. 14 Ma mb͕e m'huru na ha agazighi dika ezi-okwu nke ozi ọma si di, asirim Kifas n'iru ha nile, Ọ buru na gi onwe-gi adi ndu dika ndi mba ọzọ, ma ọ bughi dika ndi-Ju, ọ bu ezie na i bu onye-Ju, ì si aṅa erugide ndi mba ọzọ ka ha so uzọ ndi-Ju? 15 Ayi onwe-ayi, ọ bu ezie na ayi bu ndi-Ju dika esi mu ayi, buru kwa ndi nābughi ndi-nmehie ndi sitere na ndi mba ọzọ, 16 ma ebe ayi matara na agughi madu n'onye ezi omume site n'ọlu di iche iche nke iwu, ma ọ bu nání okwukwe ekwere na Jisus Kraist ka eji gu madu n'onye ezi omume, ọbuná ayi onwe-ayi kwere na Kraist Jisus, ka ewe gua ayi na ndi ezi omume site n'okwukwe ayi kwere na Kraist, ọ bughi kwa site n'ọlu di iche iche nke iwu: n'ihi na site n'ọlu di iche iche nke iwu ọ dighi anu-aru ọ bula, bú madu, agāgu n'onye ezi omume. 17 Ma ọ buru na ahuru na ayi onwe-ayi bu kwa ndi-nmehie, mb͕e ayi nāchọ uzọ agēsi gu ayi na ndi ezi omume nime Kraist, ọ̀ bu na Kraist bu onye nēje ozi nmehie? Chineke ekwela. 18 N'ihi na asi na ihe m'kwaturu, ihe ndia ka m'nēwuli elu ọzọ dika ulo, anameme ka madu mara na abum onye-njehie. 19 N'ihi, na mu onwem sitere n'aka iwu nwua n'ebe iwu di, ka m'we di ndu n'ebe Chineke nọ 20 Akpọgidekọwo mu na Kraist n'obe; ọ bughi kwa mu onwem nādi ndu ọzọ, kama ọ bu Kraist nādi ndu nimem ma ndu ahu m'nādi n'anu-aru ub͕u a, anamadi ya n'okwukwe, bú nke m'kwere n'Ọkpara Chineke, Onye hurum n'anya, rara kwa Onwe-ya nye n'ihim. 21 Ajughm amara nke Chineke: n'ihi na asi na ezi omume abia site n'aka iwu, ya mere Kraist nwuru n'efu.

Galetia 3

1 Ma ndi Galetia nēnweghi uche, ònye riri obi-unu, ndi ewere Jisus Kraist gosi ọra madu n'anya-unu, dika Onye akpọgidereri n'obe? 2 Náni nka ka m'nāchọ imata n'ọnu-unu, Ùnu sitere n'ọlu di iche iche nke iwu nata Mọ Nsọ, ma-ọbu na unu sitere n'ọnunu nke okwukwe nata Ya? 3 Ùnu bu ndi nēnweghi uche otú a? ebe unu malitere na Mọ Nsọ, ọ̀ bu n'anu-aru ka anēme ka unu zue okè ub͕u a? 4 Ùnu huru ọtutu ahuhu di otú a n'efu? ma asi na ọ bu ezie na unu huru ha n'efu. 5 Ya mere Onye ahu Nke nwe inyezu unu Mọ Nsọ, Nke nāluputa kwa ọlu di ike nime unu, Ò sitere n'ọlu di iche iche nke iwu ma-ọbu na o sitere n'ọnunu nke okwukwe nēme ya? 6 Dika Abraham kwere Chineke, ewe gua nke ahu nye ya n'ezi omume. 7 Ya mere maranu na ndi sitere n'okwukwe, ndi ahu bu umu Abraham. 8 Ma ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, ebe o buru uzọ hu na Chineke nēsite n'okwukwe gu ndi mba ọzọ na ndi ezi omume, o buru uzọ zìe Abraham ozi ọma, si, Agāgọzi mba nile nime gi. 9 Ya mere ndi sitere n'okwukwe, ndia ka anāgọzi, ha na onye okwukwe ahu, bú Abraham. 10 N'ihi na ka ha ra, bú ndi sitere n'ọlu nke iwu, ha nọ n'okpuru ọbubu-ọnu: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye anābu ọnu ka ọ bu, bu onye ọ bula nke nānọgideghi n'ihe nile edeworo n'akwukwọ iwu, ime ha. 11 Ma ọ putara ìhè na ọ dighi onye ọ bula anāgu n'onye ezi omume n'iwu n'iru Chineke: n'ihi na, Onye ezi omume gēsite n'okwukwe di ndu; 12 ma iwu ahu esiteghi n'okwukwe; kama, Onye nēme ihe ndia gādi ndu nime ha. 13 Kraist b͕aputara ayi n'ọbubu-ọnu nke iwu ahu, ebe Ọ ghọrọ ọbubu-ọnu n'ọnọdu-ayi: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye anabu ọnu ka ọ bu, bú onye ọ bula nke anākwuba n'elu osisi: 14 ka ngọzi nke Abraham we rue ndi mba ọzọ nime Kraist Jisus; ka ayi we site n'okwukwe ahu nara nkwa Nke bu Mọ Nsọ. 15 Umu-nnam, anamekwu dika madu: Asi na ọ bu nání ọb͕ub͕a-ndu madu, mb͕e edozisiri ya nke-ọma, ọ dighi onye ọ bula nēwezuga ya, ma-ọbu nētiye ihe ọzọ nime ya. 16 Ma ọ bu Abraham ka ekwere nkwa ndia, ya na Nkpuru-ya. Ọ sighi, Na nkpuru, dika Ọ nēkwu okwu bayere ọtutu; kama dika Ọ nēkwu okwu bayere otù Onye, Ọ si, Na Nkpuru-gi, Nke bu Kraist. 17 Ma nka bu ihe m'nēkwu; Ọb͕ub͕a-ndu nke Chineke buruworo uzọ dozie nke-ọma, iwu ahu, nke putara mb͕e nnù arọ na orú arọ na iri gasiri, ewezugaghi ọb͕ub͕a-ndu ahu, ime nkwa ahu ka ọ ghara idi irè. 18 N'ihi na asi na ihe-nketa ahu sitere n'iwu, o siteghi kwa na nkwa ọzọ: ma Chineke esitewo na nkwa nye Abraham ihe-nketa ahu n'amara. 19 Gini kwa bu iwu ahu? Atukwasiri ya n'ihi njehie, rue mb͕e Nkpuru ahu gābia, bú Onye ekweworo nkwa; esitekwara n'aka ndi-mọ-ozi nye iwu ahu site n'aka onye-ob͕ub͕o. 20 Ma onye-ob͕ub͕o abughi nke otù onye; ma Chineke bu otù onye. 21 Ya mere, ìwu ahu nēmegide nkwa Chineke? Chineke ekwela: n'ihi na asi na enyereri iwu nke puru ime ka adi ndu, n'ezie ezi omume gēsitewori n'iwu. 22 Otú ọ di, ihe edeworo n'akwukwọ nsọ mechibidoro ihe nile n'okpuru nmehie, ka ewe were nkwa ahu nke sitere n'okwukwe ekwere na Jisus Kraist nye ndi kwere ekwe. 23 Ma mb͕e okwukwe akābiaghi, anēche ayi nche n'okpuru iwu, ebe anēmechibido ayi rue okwukwe ahu nke agaje ikpughe. 24 Ya mere iwu ahu aghọwo onye-ozìzí-ayi ikpọrọ ayi biakute Kraist, ka ewe site n'okwukwe gua ayi na ndi ezi omume. 25 Ma ebe okwukwe ahu biaworo, ayi anọghi ọzọ n'okpuru onye-ozizí. 26 N'ihi na unu nile bu umu Chineke, site n'okwukwe, nime Kraist Jisus. 27 N'ihi na ka unu ra, bú ndi emere baptism ibà nime Kraist, unu yikwasiri Kraist. 28 Onye-Ju ma-ọbu onye-Grik apughi idi, orù ma-ọbu onye nwe onwe-ya apughi idi, nwoke na nwanyi apughi idi: n'ihi na unu onwe-unu nile bu otù onye nime Kraist Jisus. 29 Ma ọ buru na unu onwe-unu bu ihe di n'aru nke Kraist, ya mere unu bu nkpuru Abraham, buru ndi-nketa dika nkwa si di.

Galetia 4

1 Ma asim na ka oge ra onye-nketa ahu nọ ka nwa ọhu, ọ dighi iche n'ihe ọ bula n'ebe orù nọ, ọ bu ezie na ọ bu onye-nwe ihe nile; 2 kama ọ nọ n'okpuru ndi etiyere ya n'aka-ha na ndi nāchi èzí-na-ulo-ya rue oge nna-ya buru uzọ ka àka. 3 Otú a ayi onwe-ayi kwa, mb͕e ayi bu umu ọhu, ọ bu n'okpuru ihe-ozizí mbu nke uwa ka ejidere ayi dika orù 4 ma mb͕e oge ahu zuru, Chineke ziputara Ọkpara-Ya, Onye amuru site na nwanyi, Onye amuru n'okpuru iwu, 5 ka O we b͕aputa ndi nọ n'okpuru iwu, ka ayi we nata idi-ka-umu-ndikom ahu. 6 Ma n'ihi na unu bu umu-ndikom, Chineke ziputara Mọ nke Ọkpara-Ya ba nime obi-ayi, nēti nkpu, si, Aba, Nna. 7 Ya mere i bughi orù ọzọ, kama i bu nwa-nwoke; ma ọ buru na i bu nwa-nwoke, i bu kwa onye-nketa site n'aka Chineke. 8 Otú ọ di, mb͕e ahu, ebe unu nāmataghi Chineke, unu bu orù nke ndi nābughi chi dika ha si puta n'uwa: 9 ma ub͕u a, mb͕e unu maworo Chineke, ma-ọbu, nke bu ezi-okwu kari, unu bu ndi Chineke maworo, ùnu si aṅa chighari ọzọ n'ihe-ozizí mbu nādighi ike nēnweghi kwa ihe ọ bula, nke unu nācho ibu orù-ha ọzọ ọhu? 10 Unu nēlezi anya idebe ubọchi, na ọnwa, na oge, na arọ. 11 Anamatu egwu unu, ma o nwere uzọ ọ bula m'dọb͕uworo onwem n'ọlu n'aru unu n'efu. 12 Umu-nnam, ariọm unu, menu onwe-unu ka unu di ka mu onwem, n'ihi na mu onwem me-kwa-ra onwem ka m'di ka unu onwe-unu. Unu emeghm ajọ omume ọ bula: 13 ma unu matara na ọ bu n'ihi adighi-ike nke anu-aru ka m'zìri unu ozi ọma na mbu: 14 unu akpọghi kwa ihe di n'anu-arum nke bu ọnwunwa n'ebe unu nọ ihe-efu, ọ sọghi kwa unu oyi; kama unu naram nke-ọma dika mọ-ozi nke Chineke, dika Kraist Jisus. 15 Òle ebe ọ di kwa, bú ọkpukpọ unu nākpọ onwe-unu ndi ngọzi diri? n'ihi na ab͕aram unu àmà, na, ọ buru na ọ bu ihe unu puru ime, unu gāghuputawori anya-unu nyem. 16 Ya mere àghọwom onye-iro-unu, n'ihi na anamagwa unu ezi-okwu? 17 Ha were obi nānu ọku chọ unu n'uzọ nādighi nma; ma ha nāchọ imechibido unu uzọ n'èzí, ka unu we were obi nānu ọku chọ ha. 18 Ma ọ di nma ka ewere obi nānu ọku chọ unu n'ihe ọma mb͕e nile, ọ bughi kwa nání mb͕e m'nọ n'etiti unu. 19 Umu-ntakirim, unu ndi ime unu nēmem ọzọ rue mb͕e agēme ka udi Kraist di nime unu, 20 ọ gādim nọ̄ nma ma asi na apurum inọ n'etiti unu ub͕u a, na ib͕anwe olu m; n'ihi na enwerem obi abua n'ebe unu nọ. 21 Gwanum, unu ndi nāchọ inọ n'okpuru iwu, ùnu adighi-anu iwu ahu? 22 N'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, na Abraham nwere umu-ndikom abua, otù site n'orù-nwanyi ahu, otù site kwa na nwanyi ahu nke nwere onwe-ya. 23 Ma ọ bu n'uzọ anu-aru ka amuworo nwa nke sitere n'orù-nwanyi ahu; ma esitewo na nkwa mu nwa nke sitere na nwanyi ahu nwere onwe-ya. 24 Ma ewere ihe ndia ma atù: n'ihi na ndinyom abua ndia bu ọb͕ub͕a-ndu abua; otù si n'ugwu Sainai puta, nāmu umu nye n'orù, nwanyi ahu bu Hega. 25 N'ihi na Sainai nka bu ugwu di n'Arebia, ya na Jerusalem nke di ub͕u a kwu kwa: n'ihi na ọ nọ n'orù, ya na umu-ya. 26 Ma Jerusalem nke di n'elu nwere onwe-ya, ya onwe-ya bu kwa nne ayi. 27 N'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ka obi nātọ gi utọ, nwanyi-àgà nke nādighi-amu nwa; Tiwa nkpu ọṅù, ti kwa nkpu, gi onye ime nādighi-eme: N'ihi na umu nke nwanyi arapuru nání ya di ọtutu kari umu nke nwanyi ahu nwere di. 28 Ma ayi onwe-ayi, umu-nnam, bu umu nke nkwa, dika Aisak. 29 Ma dika onye amuru n'uzọ anu-aru sob͕uru onye amuru n'uzọ Mọ Nsọ mb͕e ahu, ọbuná otú a ka ọ di ub͕u a. 30 Otú ọ di, gini ka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nēkwu? Chupu orù-nwanyi a na nwa-ya nwoke: n'ihi na nwa-nwoke orù-nwanyi agagheso nwa nke nwanyi ahu nke nwere onwe ya keta ihe. 31 N'ihi nka, umu-nnam, ayi abughi umu nke orù-nwanyi, kama ayi bu umu nke nwanyi ahu nwere onwe-ya.

Galetia 5

1 Kraist mere ka ayi pua n'orù ka ayi we nwere onwe-ayi: ya mere nēguzosinu ike, unu ekwela ka ewere yoke nke bu ibu-orù jide unu ọzọ. 2 Le, mu onwem Pọl si unu, na, asi na unu ekwe ka ebì unu úgwù, Kraist agaghi-abara unu urù ọ bula. 3 Ma agwasim onye ọ bula ike, bú onye kwere ka ebì ya úgwù, na ọ bu onye ji ugwọ idebe iwu ahu dum. 4 Atọpuru unu n'aru Kraist, unu ndi nāchọ ka ewere iwu gua unu na ndi ezi omume; unu siri n'amara dapu. 5 N'ihi na ayi onwe-ayi ji Mọ Nsọ nēchesi ihe anēle anya ike, bú ezi omume, site n'okwukwe. 6 N'ihi na nime Kraist Jisus ọ dighi ike ọ bula obibì-úgwù ma-ọbu ebìghi-úgwù nwere; kama nke nwere ike bu okwukwe nke sitere n'aka ihu-n'anya alusi ọlu ike. 7 Unu nāb͕arì ọsọ nke-ọma; ònye b͕ochiri unu, ka unu ghara ikweyere ezi-okwu ahu? 8 Nkweye ahu emere ka unu kweye esiteghi n'Onye ahu Nke nākpọ unu. 9 Ihe-iko-achicha di ntà nēko ob͕e utu ọka agwọrọ agwọ dum. 10 Mu onwem atukwasiwo obim n'ebe unu nọ nime Onye-nwe-ayi, na unu agaghi-atukwasi uche n'ihe ọ bula ọzọ: ma onye nēme ka obi lọ unu miri gēbu ikpé-ya, onye ọ bula. 11 Ma mu onwem, umu-nnam, ọ buru na anọm nēkwusa ibì-úgwù, gini mere anọ nēsob͕um? m'kwusa otú a, emewo ka ọnyà nka, bú obe, ghara idi irè. 12 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ndi nēkpù unu iru gēme onwe-ha onozi. 13 N'ihi na unu onwe unu, umu-nnam, ka akpọrọ ka unu nwere onwe-unu; nání unu ewerela inwe-onwe-unu ahu nye ka ọ buru ihe anu-aru-unu gēji me ihe kama werenu ihunanya burita orù ibe-unu. 14 N'ihi na edebezuwo iwu nile n'otù okwu, bú nka; Hu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi. 15 Ma ọ buru na unu atarita ibe-unu aru, ripia kwa ibe-unu, lezienu anya ka unu ghara ikpochapurita onwe-unu. 16 Ma asim, Nējegharinu site na Mọ Nsọ, unu agaghi-emezu kwa agu nke anu-aru maọli. 17 N'ihi na agu nāgu anu-aru megide Mọ Nsọ, agu nāgu kwa Mọ Nsọ megide anu-aru; n'ihi na ndia nēmegide onwe-ha; ka unu we ghara ime ihe ndia ọ bula unu nāchọ ime. 18 Ma ọ buru na Mọ Nsọ nēdu unu, unu anọghi n'okpuru iwu. 19 Ma ọlu nile nke anu-aru putara ìhè, nke di ka ndia, ikwa-iko, adighi-ọcha, agu ikwa-iko, 20 ikpere-arusi, igwọ-ńsí, ibu-iro, esem-okwu, ekworo, ọnuma, ikpa-iche-iche, nkewa, irọ-òtù, 21 ikpọ-asì, iṅubiga-manya-ókè, ite-egwú, na ihe yiri ihe ndia: nke m'buru uzọ gwa unu, dika m'buru uzọ gwa unu n'oge gara aga, na ndi nēme ihe di otú a agaghi-eketa ala-eze Chineke. 22 Ma nkpuru nke Mọ Nsọ bu ihu-n'anya, ọṅù, udo, ogologo-ntachi-obi; obi-ọma, idi-nma, ikwesi-ntukwasi-obi, 23 idi-nwayọ, imerū-ihe-n'ókè: ọ dighi iwu nēmegide ihe nile di otú a. 24 Ma ndi nke Kraist-ayi Jisus kpọgidere anu-aru-ha n'obe, ya na ọchichọ ọjọ nile na agu ihe ọjọ nile di ya. 25 Ọ buru na ayi di ndu site na Mọ Nsọ, ka ayi nāgazi kwa site na Mọ Nsọ. 26 Ka ayi ghara ighọ ndi nāchọ otuto efu, nāchọrita ibe-ayi okwu, nākpọrita ibe-ayi asì.

Galetia 6

1 Umu-nnam, asi na ọ bu ezie na anwude madu mb͕e ọ nọ na ndahie ọ bula, unu onwe-unu, bú ndi Mọ Nsọ nāchi, menu ka madu di otú a guzozie nime mọ nke idi-nwayọ; nēlezi onwe-gi anya, ka aghara inwa kwa gi onwe-gi. 2 Nēburitanu ibu nānyi ibe-unu, nēdebezu-kwa-nu iwu Kraist n'uzọ di otú a. 3 N'ihi na asi na madu nēchè na ya bu ihe, mb͕e ọ nābughi ihe ọ bula, ọ nāghọ onwe-ya aghughọ n'obi. 4 Ma ka onye ọ bula nwaputa ọlu nke aka ya, mb͕e ahu ka ọ gēnwe kwa ihe ọ gānyara isi n'ebe nání ya onwe-ya nọ, ọ bughi kwa n'ebe ibe-ya nọ. 5 N'ihi na madu nile n'otù nọtù gēbu ibu nke aka ha. 6 Ma onye ewere okwu ọnu nēzi okwu Chineke, ya me ka onye nēwere okwu ọnu nēzi ya so ya nēnwekọ ezi ihe nile. 7 Una ekwela ka eduhie unu; Chineke abughi onye anēlelì: n'ihi na nkpuru ọ bula madu nāgha, nke ahu ka ọ gēweta kwa n'ubi. 8 N'ihi na onye nāgha nkpuru nye anu-aru onwe-ya gēsite n'anu-aru ahu weta nmebi dika ihe-ubi; ma onye nāgha nkpuru nye Mọ Nsọ gēsite na Mọ Nsọ weta ndu ebighi-ebi dika ihe-ubi 9 Ma ike agwula ayi n'obi n'ime ihe ọma: n'ihi na ayi gēweta ihe-ubi mb͕e oge-ya ruru, ma ayi adaghi #mbà. 10 Ya mere otú a, otú ayi nwere oge, ka ayi nālu ezi ihe n'ebe madu nile nọ, ma ka ayi nālu ezi ihe karisia n'ebe ndi èzí-na-ulo nke okwukwe-ayi nọ. 11 Lenu otú nkpuru-akwukwọ m'ji aka nkem degara unu di okpotokpo. 12 Ka ha ra, bú ndi nāchọ ka ha ma nma n'anu-aru n'iru madu, ndi ahu nērugide unu ka ebì unu úgwù; ihe ha ji me ya bu nání ka ewe ghara isob͕u ha n'ihi obe Kraist. 13 N'ihi na ndi kwere ka ebì ha úgwù, ọbuná ha onwe-ha adighi-edebe iwu; kama ha nācho ka ebì unu úgwù, ka ha we nya isi n'anu-aru unu onwe-unu. 14 Ma Chineke ekwela ka m'nya isi, ma-ọbughi n'obe Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, nke esiteworo na ya kpọgide uwa n'ebe m'nọ, kpọgide kwa mu onwem n'ebe uwa di. 15 N'ihi na obibì-úgwù abughi ihe, ebìghi-úgwù abughi kwa ihe, kama ọ bu òkìkè ọhu. 16 Ka ha ra kwa, bú ndi gāgazi dika ihe-ọtùtù a si di, udo dikwasi ha, ya na ebere, dikwasi kwa Israel nke Chineke. 17 Site n'ub͕u a ka onye ọ bula ghara isob͕um: n'ihi na mu onwem nēbu n'arum apa di iche iche nēgosi na abum onye Jisus. 18 Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist diyere mọ-unu, umu-nnam. Amen.

Efesọs 1

1 Pọl, onye-ozi nke Kraist Jisus site n'ọchichọ nke Chineke, nēdegara ndi nsọ ndi nọ n'Efesọs, na ndi kwere na Kraist Jisus, akwukwọ: 2 Amara diri unu na udo nke si n'aka Chineke, bu Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist puta. 3 Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, Onye were ngọzi nile ọ bula nke Mọ Nsọ gọzie ayi n'ebe di n'elu-igwe nime Kraist: 4 dika Ọ roputara ayi nime Ya mb͕e akātọghi ntọ-ala uwa, ka ayi we di nsọ buru kwa ndi anāpughi ita uta n'iru Ya n'ihu-n'anya: 5 ebe O buru uzọ ka ayi àkà ka ewe site n'aka Jisus Kraist do ayi ka umu-Ya ndikom, dika ọ di Ya ezi nma n'ọchichọ-Ya, 6 ka ewe to ebube nke amara-Ya, bú nke O were amara me ka ayi nara n'aka-Ya nime Onye ahu Ọ huru n'anya: 7 Onye ayi sitere n'ọbara-Ya nwe nb͕aputa-ayi nime Ya, bú nb͕aghara nke ndahie nile ayi, dika àkù nke amara-Ya si di, 8 nke O mere ka ọ babigara ayi ókè n'amam-ihe na uche nile, 9 mb͕e O mesiri ka ayi mara ihe-omimi nke ihe Ọ chọrọ, dika ọ di Ya ezi nma, bú ihe O zubere nime Ya, 10 rue ọchichi-èzi-na-ulo nke ozuzù oge akara àkà, ichikọta ihe nile nime Kraist-ayi dika Isi, bú ihe nile di n'elu-igwe, na ihe nile di n'elu uwa; nime Ya, ka m'kwuru, 11 Nke eme-kwa-ra ayi ka ayi buru ihe-nketa nime Ya, ebe eburu uzọ ka ayi àkà dika Onye ahu zubere, Onye nālusi ihe nile ike dika ìzù nke ọchichọ-Ya si di; 12 ka ayi we buru ihe agēji to ebube-Ya, ayi ndi leworo anya Kraist na mbu: 13 Onye unu onwe-unu nọ kwa nime Ya, mb͕e unu nuru okwu nke ezi-okwu ahu, bú ozi ọma nke nzọputa-unu, ọ bu kwa nime Ya, mb͕e unu kwekwa-ra na Ya, ka eji Mọ Nsọ nke nkwa ahu ka unu akàrà, 14 bú Mọ Nsọ, Onye bu ihe ayi ji mara na ayi gēketazu ihe-nketa-ayi, rue nb͕aputa nke ihe Chineke nwetara, ka ewe to ebube-Ya. 15 N'ihi nka mu onwem kwa, ebe m'nuru okwu bayere okwukwe di nime unu nke unu kwere n'Onye-nwe-ayi Jisus, na ihu-n'anya unu ji hu ndi nsọ nile, 16 ewepughi m aka n'ikele ekele bayere unu, nēhotakwa unu n'ekperem; 17 ka Chineke nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, bú Nna nke ebube, we nye unu Mọ nke amam-ihe na nkpughe nime nmazu-Ya; 18 ebe emeworo ka anya obi-unu nara ìhè, ka unu we mata ihe bu olile-anya nke ọkpukpọ-Ya, mata kwa ihe bu àkù nke ebube nke ihe-nketa-Ya n'etiti ndi nsọ Ya, 19 mata kwa otú ike-Ya di uku ri nne n'ebe ayi nọ, bú ndi kwere, dika ilusi-ọ1u-ike nke idi-ike nke ike-Ya si di, 20 nke Ọ lusiri ike nime Kraist, mb͕e O mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, me kwa ka Ọ nọdu n'aka-nri-Ya n'ebe di n'elu-igwe, 21 kachasi ha nile elu, bú ibu-onye-isi, na ichi-isi, na ike, na ibu-onye-nwe-madu, na aha ọ bula anākpọ ya aha, ọ bughi nání n'oge a, kama ọ bu kwa n'oge nke gaje ibia: 22 O do-kwa-ra ihe nile n'okpuru ukwu-Ya abua, ọ bu kwa Ya onwe-ya ka O mere ka Ọ buru isi n'elu ihe nile n'ebe nzukọ-Ya nọ, 23 nke bu aru-Ya, ozuzù nke Onye ahu Nke nāluzu ihe nile nime madu nile.

Efesọs 2

1 Unu onwe-unu ka O me-kwa-ra ka unu di ndu, mb͕e, unu nọ n'ọnwu site na ndahie nile unu na nmehie nile unu, 2 nke unu jeghariri nime ha n'oge gara aga n'uzọ oge nke uwa nka, dika onye-isi nke ike nke mbara-elu-igwe si chọ, bú mọ ahu nke nālusi ọlu ike nime umu nke ekweyeghi-ekwenye ub͕u a; 3 ndi ayi onwe-ayi nile bi-kwa-ra obi n'etiti ha n'oge gara aga nime agu ihe ọjọ nke anu-aru-ayi, nēme ihe nile anu-aru-ayi na èchìchè-uche-ayi chọrọ, buru kwa umu nke iwe dika esi mu ayi, dika ndi fọduru bu kwa: 4 ma Chineke, ebe Ọ bu ọgaranya n'ebere, n'ihi oké ihunanya-Ya Ọ huru ayi, 5 ọbuná mb͕e ayi nọ n'ọnwu site na ndahie nile ayi, O mere ka ayi so Kraist dikọ ndu (ejiwo amara zọputa unu), 6 me kwa ka ayi so Ya si n'ọnwu bilikọ, me kwa ka ayi so Ya nọdukọ n'ebe di n'elu-igwe, nime Kraist Jisus: 7 ka Ọ we gosi ihe a n'oge nile gaje ibia, bú àkù nke amara-Ya di uku ri nne, n'obi-ọma n'ebe ayi nọ nime Kraist Jisus: 8 n'ihi na ọ bu amara ka ejiworo zọputa unu, site n'okwukwe; nka esiteghi kwa n'onwe-unu: ọ bu onyinye Chineke: 9 o siteghi n'ọlu, ka onye ọ bula we ghara inya isi. 10 N'ihi na ayi bu ihe O mere, ndi ekère èkè nime Kraist Jisus ilu ezi ọ1u, nke Chineke buru uzọ dozie ka ayi we jegharia nime ha. 11 N'ihi nka chetanu, na n'oge gara aga unu onwe-unu, bú ndi mba ọzọ n'anu-aru, ndi ha nākpọ aha Ebìghi-úgwù, bú ndi anākpọ aha Obibì-úgwù, n'anu-aru, nke eji aka me; 12 na unu guzoro iche n'ebe Kraist nọ n'oge ahu, ndi emereri ka unu buru ndi ala ọzọ n'ebe ọnọdu ndi amuru ndi Israel di, unu bu kwa ndi-ọbìa n'ebe ọb͕ub͕a-ndu nile nke nkwa ahu di, ndi nēnweghi olile-anya, ndi nāmaghi kwa Chineke n'uwa. 13 Ma ub͕u a nime Kraist Jisus unu onwe-unu, bú ndi nọ n'ebe di anya n'oge gara aga, unu ka emere ka unu nọ nso nime ọbara Kraist. 14 N'ihi na Ya onwe-ya bu udo-ayi, Onye mere ihe abua ahu ka ha buru otù ihe, Onye kwada-kwa-ra mb͕idi etiti nke ngige, 15 ebe ọ bu nime anu-aru-Ya ka O mere ka iro ahu ghara idi irè, bú iwu nke bu ihe di iche iche enyere n'iwu; ka O we were madu abua ahu kè otù madu ọhu nime onwe-ya, nēme ka udo di; 16 ka O we were kwa obe-Ya me ka ha abua na Chineke di n'otù nime otù aru, ebe O b͕usiri iro ahu nime ya: 17 O we bia zì unu ndi nọ n'ebe di anya ozi ọma nke udo, zì kwa ndi nọ nso ozi ọma nke udo: 18 n'ihi na ayi abua sitere n'aka-Ya nwe nkpọbata-ayi n'ebe Nna nọ nime otù Mọ Nsọ. 19 Ya mere otù a unu abughi ndi-ọbìa na ndi nānọ dika ọbìa ọzọ site n'ub͕u a, kama unu soro ndi nsọ buru ndi amuru n'ala, unu bu kwa ndi èzi-na-ulo Chineke, 20 ewu-kwa-ra unu dika ulo n'elu ntọ-ala nke bu ndi-ozi na ndi-amuma, nke isi nkume nime nkuku ntọ-ala ahu bu Kraist Jisus onwe-ya; 21 ọ bu kwa nime Ya ka ulo nile ọ bula anēwu n'ulo ahu, ebe anējikọ ha nke-ọma, nāba uba we buru ulo nsọ nime Onye-nwe-ayi; 22 Onye anēwukọ kwa unu onwe-unu nime Ya ka unu we buru ebe-obibi nke Chineke nime Mọ Nsọ.

Efesọs 3

1 N'ihi nka mu onwem Pọl, onye-nkpọrọ nke Kraist Jisus n'ihi unu ndi mba ọzọ, 2 asi na ọ bu ezie na unu nuru okwu bayere ọchichi-èzí-na-ulo nke amara Chineke ahu nke enyerem n'ebe unu nọ; 3 na emere ka m'mara ihe-omimi ahu n'uzọ nkpughe, dika m'deworo n'akwukwọ a na mbu n'okwu ole-na-ole, 4 nke unu gēji pu ihuta nghọtam n'ihe-omimi nke Kraist, mb͕e unu guru ya; 5 nke anēmeghi ka umu madu mara ya n'ọb͕ọ ọzọ, dika ekpughere ya ub͕u a nye ndi-ozi-Ya na ndi-amuma-Ya di nsọ nime Mọ Nsọ; 6 bú, na ndi mba ọzọ bu ndi soro ayi ketakọ ihe, na idikọ n'otù aru, na ikèkọ nkwa ahu nime Kraist Jisus site n'ozi ọma, 7 nke emerem ka m m'buru onye nēje ozi ya, dika onyinye nke amara ahu nke Chineke si di nke enyerem dika ilusi-ọlu-ike nke ike-Ya si di. 8 Ọ bu mu onwem, bú onye di ntà kari onye dikarisiri ntà n'etiti ndi nsọ nile, ka enyere amara nka, izisara ndi mba ọzọ ozi ọma nke àkù nke Kraist nke anēnweghi ike ituputa ya; 9 na inye ha nile ìhè ihu ihe bu ọchichi-èzí-na-ulo nke ihe-omimi ahu nke ezoworo nime Chineke site n'oge nile, Onye kère ihe nile; 10 ka ewe me ub͕u a ka ibu-isi nile na ike nile nke di n'ebe di n'elu-igwe mara ọtutu okpukpu amam-ihe Chineke di iche iche site n'aka nzukọ-Ya, 11 dika ìzù nke mb͕e nile ebighi-ebi si di nke O zubere nime Kraist-ayi, bú Jisus Onye-nwe-ayi: 12 ọ bu kwa nime Ya ka ayi sitere n'okwukwe nke ayi kwere na Ya nwe nkwuwa-okwu na nkpọbata nime ntukwasi-obi. 13 N'ihi nka ariọm aririọ ka ike ghara igwu unu n'obi nime nkpab͕um nile n'ihi unu, nke bu otuto-unu. 14 Ọ bu n'ihi nka ka m'ji b͕ue ikperèm abua n'ala nye Nna-ayi, 15 Onye esitere na Ya gu eriri-nna nile ọ bula n'elu-igwe na n'elu uwa aha, 16 ka O we nye unu, dika àkù nke ebube-Ya si di, ka ewere ike me ka unu di ike site n'aka Mọ-Ya nābata nime madu ime unu; 17 ka Kraist we site n'okwukwe-unu bigide nime obi-unu; ka unu, ebe unu b͕agideworo nkpọrọgwu nime ihu-n'anya buru kwa ndi atọworo ntọ-ala nime ya, 18 ka unu we nara ike ighọta, unu na ndi nsọ nile, ihe bu obodobo na ogologo na idi-elu na omimi, 19 na imara ihu-n'anya Kraist nke kariri ọmuma nke-uku ri nne, ka ewe me ka unu zue ezù rue ozuzù nile nke Chineke. 20 Ma otuto diri Onye ahu Onye puru imebiga ókè nke-uku ri nne kari ihe nile nke ayi nāriọ ma-ọbu nke ayi nātughari uche, dika ike nke nālusi ike nime ayi si di, 21 otuto diri Ya nime nzukọ-Ya na nime Kraist Jisus rue ọb͕ọ nile nke mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.

Efesọs 4

1 Ya mere mu onwem, bú onye-nkpọrọ nime Onye-nwe-ayi, nāriọ unu ka unu jegharia dika o kwesiri ọkpukpọ nke akpọrọ unu, 2 n'obi di ume-ala na idi-nwayọ nile, n'ogologo ntachi-obi, nānagiderita ibe-unu nime ihu-n'anya; 3 nānu ọku n'obi idebe idi-n'otù nke Mọ Nsọ nime ihe-ọkiké nke bu udo. 4 Otù aru di, otù Mọ di kwa, dika akpọ-kwa-ra unu nime otù olile-anya nke ọkpukpọ-unu; 5 otù Onye-nwe-ayi di, otù okwukwe di, otù baptism di, 6 otù Chineke na Nna nke ayi nile di, Onye bu isi ayi nile, Onye site-kwa-ra n'aka ayi nile nālu ọlu, Onye nānọ kwa nime ayi nile. 7 Ma ọ bu ayi nile n'otù n'otù ka enyere amara ahu dika ọtùtù nke onyinye Kraist si di. 8 N'ihi nka Ọ si, Mb͕e Ọ rigoro n'elu, Ọ dọtara usu ndi adọtara n'agha n'agha, Nye kwa madu onyinye di iche iche. 9 (Ma okwu nka, Ọ rigoro, gini ka ọ bu ma-ọbughi na Ọ rida-kwa-ra nime akuku uwa dikariri ala? 10 Onye ridara bu kwa Onye ahu Nke rigoro n'ebe kachasi elu-igwe nile elu nke-uku, ka O we mezu ihe nile. ) 11 Ya onwe-ya nye-kwa-ra ufọdu ka ha buru ndi-ozi; nye kwa ufọdu ka ha buru ndi-amuma; nye kwa ufọdu ka ha buru ndi nēzisa ozi ọma; nye kwa ufọdu ka ha buru ndi nāzù aturu Chineke na ndi-ozizí; 12 ime ka ndi nsọ zu okè ilu ọlu nke ije-ozi, iwuli aru nke Kraist elu dika ulo: 13 rue mb͕e ayi nile gēru idi-n'otù nke okwukwe na nke nmazu nke Ọkpara Chineke, ru ibu nwoke tozuru okè, ru ọtùtù nke ogologo nke ozuzù nke Kraist: 14 ka ayi we ghara ibu umu ọhu ọzọ, ndi ifufe nile ọ bula nke ozizí nēfeghari nēbughari kwa, nime itu-ntu nke madu, nime aghughọ, nke ha ji ezuputa nduhie; 15 kama ka ayi we nēso ezi-okwu nime ihu-n'anya, we tó etó rue nime Ya n'ihe nile, Onye bu isi-ayi, bú Kraist; 16 Onye aru nile, ebe anēwere nkwonkwo nile ọ bula nke nnyezu kwukọ ya nke-ọma jikọ kwa ya, dika ilusi-ọ1u-ike nke akuku nile ọ bula n'otù n'otù n'ọtùtù-ha si di, aru nile ahu nēsite na Ya nēme ka aru ba uba iwuli onwe-ya elu dika ulo nime ihu-n'anya. 17 Ya mere nka ka m'nēkwu, kwusi kwa ike nime Onye-nwe-ayi, ka unu ghara ijeghari ọzọ dika ndi mba ọzọ nējeghari kwa, n'ihe-efu nke uche-ha, 18 n'ihi na emewo ka ha b͕a ọchichiri n'èchìchè-uche-ha, eme kwa ka ha buru ndi ala ọzọ n'ebe ndu nke Chineke di n'ihi amaghi-ihe di nime ha, n'ihi na anēme ka obi-ha me etili; 19 madu ndi, ebe nmehie-ha nādighi-ewuta ha ọzọ, ha rara onwe-ha nye n'aka agu ikwa-iko, iluputa adighi-ọcha nile nime anya-uku. 20 Ma unu onwe-unu amutaghi Kraist-ayi otú a; 21 asi na ọ bu ezie na ọ bu Ya onwe-ya ka unu nuru, asi kwa na ọ bu nime Ya ka ezíri unu ihe, dika ezi-okwu di nime Jisus: 22 ka unu tupu madu ochie unu, nke nēmebi emebi n'uzọ agu nke aghughọ, dika ibi-obi-unu na mbu si di; 23 ka eme kwa ka unu di ọhu na mọ nke uche-unu, 24 ka unu yikwasi kwa madu ọhu unu, nke ekère dika Chineke chọrọ nime ezi omume na idi-ọcha nke ezi-okwu ahu. 25 N'ihi nka, ebe unu tupuru okwu-ugha, nēkwunu ezi-okwu onye ọ bula n'ebe onye-ab͕ata-obi-ya nọ: n'ihi na ayi nāburita ihe di n'aru ibe-ayi. 26 Unu emehiela mb͕e unu nēwe iwe: ekwela anyanwu da na nkpasu-iwe-unu: 27 enye-kwa-la ekwensu uzọ. 28 Ka onye nēzu ori ghara izu kwa ori ọzọ: kama ka ọ dọb͕u onwe-ya n'ọlu, nēji aka ya abua lu ezi ihe, ka o we nwe ihe ya na onye nọ na nkpà gēketa. 29 Ka okwu ọ bula nke ruru aru ghara isi n'ọnu-unu puta, kama ihe bu ezi ihe, iwuli madu elu dika ulo, dika nkpà si di, ka o we nye ndi nānu ya amara. 30 Unu eme-kwa-la ihe gēwuta Mọ Nsọ nke Chineke, Onye akara unu akàrà nime Ya rue ubọchi nb͕aputa. 31 Ka ewepu ihe-ilu na ọnuma na iwe na iti-nkpu na nkwulu nile, ha na obi ọjọ nile, n'etiti unu: 32 nweritanu obiọma n'aru ibe-unu, nwenu obi ọmiko, were-kwa-nu amara b͕aghara onwe-unu, dika Chineke were-kwa-ra amara b͕aghara unu nime Kraist.

Efesọs 5

1 Ya mere burunu ndi nēṅomi Chineke. dika umu ahuru n'anya; 2 nējeghari-kwa-nu n'ihu-n'anya, dika Kraist-ayi hu-kwa-ra unu n'anya, rara kwa Onwe-ya nye n'ihi ayi, dika ihe echere n'iru Chineke na àjà achuru nye Ya ka ọ buru isisì nke ihe ísì utọ. 3 Ma ikwa-iko, na adighi-ọcha nile, ma-ọbu anya-uku, ka aghara ikpọ ọbuná aha-ya n'etiti unu, dika o kwesiri ndi nsọ; 4 ma-ọbu ihe-ihere, ma-ọbu ikwu-okwu-nzuzu, ma-ọbu okwu nābaghi n'ihe, nke nēkwesigh: ma kama nke ahu ikele-ekele. 5 N'ihi na nka ka unu matara nke-ọma, na ọ dighi onye ọ bula nke bu onye nākwa iko, ma ọbu onye n-adighi ọcha, ma-ọbu onye-anya-ukwu, nke isi-ya bu onye nēkpere arusi, nwere ihe-nketa n'ala-eze nke Kraist na Chineke. 6 Unu ekwela ka onye ọ bula were okwu efu rafue unu: n'ihi na ọ bu n'ihi ihe ndia ka iwe Chineke nābiakwasi umu nke ekwenyeghi-ekwenye. 7 Ya mere, unu esola ha kekọ ihe; 8 n'ihi na unu buri ọchichiri n'oge gara aga, ma unu bu ìhè ub͕u a nime Onye-nwe-ayi: nējegharinu dika umu nke ìhè 9 (n'ihi na nkpuru nke ìhè ahu di n'idi-nma na ezi omume na eziokwu nile), 10 nānwaputa ihe di Onye-nwe-ayi ezi mma; 11 unu esola ọlu nke ọchichiri nke nāmighi nkpuru nēnwekọ ihe, ma kama nke ahu nātu-kwa-nu ha nmehie-ha n'anya; 12 n'ihi na ọ bu ihe-ihere ọbuná ikwu okwu bayere ihe nile ha nēme na nzuzo. 13 Ma ìhè nēme ka ihe nile puta ìhè mb͕e anātu ha nmehie-ha n'anya: n'ihi na ihe ọ bula anēme ka ọ puta ìhè bu ìhè. 14 N'ihi nka Ọ si, Teta, gi onye nāraru ura, Si kwa na ndi nwuru anwu bilie, Kraist ahu gāmukwasi kwa gi. 15 Ya mere lezienu anya nke-ọma otú unu nējeghari, ọ dighi ka ndi nāmaghi ihe, kama dika ndi mara ihe; 16 nāzuchapuru onwe-unu oge a nile, n'ihi na ubọchi ndia jọrọ njọ. 17 N'ihi nka unu aghọla ndi nēnweghi uche, kama ghọtanu ihe bu ihe Onye-nwe-ayi nāchọ. 18 Unu aṅubiga-kwa-la manya ókè, nke ndu ila-n'iyì di nime ya, kama juputanu na Mọ Nsọ; 19 nēwere abù ọma na ukwe na abù nke Mọ Nsọ gwarita onwe-unu okwu, nēwere obi-unu bù abù kpọ kwa ubọ nye Onye-nwe-ayi; 20 nēkele kwa Chineke, bú Nna, ekele mb͕e nile n'ihi ihe nile n'aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist; 21 nēdorita onwe-unu n'okpuru ibe-unu nime egwu Kraist. 22 Ndi bu nwunye, nēdonu onwe-unu n'okpuru di nke aka unu, dika n'okpuru Onye-nwe-ayi. 23 N'ihi na di bu isi nke nwunye, dika Kraist-ayi bu kwa isi nzukọ-Ya, ebe Ya onwe-ya bu Onye-nzọputa nke aru. 24 Ma dika anēdo nzukọ ahu n'okpuru Kraist-ayi, otú a ka ndi bu nwunye do kwa onwe-ha n'okpuru di-ha n'ihe nile ọ bula. 25 Ndi bu di, hunu nwunye-unu n'anya, dika Kraist-ayi hu-kwa-ra nzukọ-Ya n'anya, rara kwa Onwe-ya nye n'ihi ya; 26 ka O we do ya nsọ, mb͕e O mesiri ka ọ di ọcha site n'ọsisa miri n'okwu Chineke, 27 ka Ya onwe-ya we che nzukọ ahu n'iru Onwe-ya dika ihe di ebube, nēnweghi ntupọ ma-ọbu iru-ndọli ma-ọbu ihe ọ bula n'ihe di otú a; kama ka o we di nsọ buru kwa ihe anāpughi ita uta. 28 Otú a ndi bu di ji kwa ugwọ ihu nwunye nke aka ha n'anya dika ha huru aru nke onwe-ha n'anya. Onye nāhu nwunye nke aka ya n'anya nāhu onwe-ya n'anya: 29 n'ihi na ọ dighi onye ọ bula kpọrọ aru onwe-ya asì mb͕e ọ bula; kama ọ nāzù ya nēlezi kwa ya anya nke-ọma, dika Kraist nēme kwa nzukọ-Ya; 30 n'ihi na ayi bu ihe di n'aru-Ya. 31 N'ihi nka ka nwoke gārapu nna-ya na nne-ya, rapara n'aru nwunye-ya; ha abua ewe ghọ otù anu-aru. 32 Ihe-omimi a di uku: ma mu onwem nēkwu okwu bayere Kraist baye-kwa-ra nzukọ-Ya. 33 Otú ọ di, unu onwe-unu n'otù n'otù hu kwa nwunye-unu n'anya, onye ọ bula ya hu nwunye nke aka ya n'anya, dika ọ nāhu onwe-ya n'anya; ka nwunye lezi kwa anya ka ọ nātu egwu di ya.

Efesọs 6

1 Umu, nāṅanu nti okwu ndi muru unu nime Onye-nwe-ayi: n'ihi na nka bu ihe ziri ezi. 2 Sọpuru nna-gi na nne-gi (nke bu ihe mbu enyere n'iwu nke nkwa diri ya), 3 ka ihe we nāgara gi nke-ọma, ka i we di kwa ogologo ndu n'elu uwa. 4 Ndi bu nna, akpasu-kwa-la umu-unu iwe: kama nāzùputa ha n'ọzùzù na idu-ọdu nke Onye-nwe-ayi. 5 Ndi-orù, werenu egwu na ima-jijiji nāṅa nti okwu ndi bu ndi-nwe-unu n'uzọ anu-aru, nime afọ-ofufo nke obi-unu, dika unu nēmere Kraist; 6 ọ bughi n'uzọ ibu-orù-n'anya, dika ndi nēme otú ọ gātọ madu utọ; kama dika ndi-orù Kraist, nēme ihe Chineke nāchọ site na nkpuru-obi-unu; 7 were-kwa-nu obi-ọma nābu orù, dika ọ bu Onye-nwe-ayi ka unu bu orù-Ya, ọ bughi kwa madu: 8 ebe unu matara na ezi ihe ọ bula onye ọ bula nēme, nka ka ọ gānaghachi n'aka Onye-nwe-ayi, ma ọ bu orù ma-ọbu onye nwe onwe-ya. 9 Ndi-nwe madu, nēme-kwa-ranu ha otù ihe ahu, nārapu iba-nba-unu: ebe unu matara na Onye-nwe ma ha ma unu nọ n'elu-igwe, ile-madu-anya-n'iru adighi kwa n'ebe Ọ nọ. 10 Nke fọduru, menu onwe-unu ka unu di ike nime Onye-nwe-ayi, ya na nime idi-ike nke ike-Ya. 11 Yikwasinu ihe-agha nile nke Chineke, ka unu we pu iguzogide ihe nile ekwensu nēzuputa. 12 N'ihi na ib͕a-nb͕a-ayi abughi imegide anu-aru na ọbara, kama ọ bu imegide ibu-ndi-isi nile, imegide ichi-isi nile, imegide ndi-onwe-uwa nke ọchichiri a, imegide ndi-agha mọ nke ajọ ihe n'ebe di n'elu-igwe. 13 N'ihi nka chilienu ihe-agha nile nke Chineke, ka unu we pu iguzogide ndi-iro-unu n'ajọ ubọchi, na iguzo, ebe unu luputaworo ihe nile. 14 Ya mere guzonu, mb͕e unu weresiri ezi-okwu ke úkwù-unu, were kwa ihe-agha nke nēb͕ochi obi yikwasi, bú ezi omume, 15 were kwa nkwadebe nke bu ozi ọma nke udo yikwasi n'ukwu-unu; 16 tukwasi ihe nile ndia welienu ọta nke bu okwukwe, nke unu gāpu imenyu àkú-uta nile nēnwu ọku nke ajọ onye ahu nime ya. 17 Nara-kwa-nu okpu-agha nke bu nzọputa, ya na mma-agha nke Mọ Nsọ, nke bu okwu Chineke: 18 site-kwa-nu n'ekpere na aririọ nile nēkpe ekpere n'oge nile nime Mọ Nsọ, were kwa inọgidesi-ike na iriọ-aririọ nile bayere ndi nsọ nile nāmu anya ime nka, 19 nēkpe kwa ekpere n'ihim, ka ewe nyem okwu n'isaghe ọnum, iwere nkwuwa-okwu me ka madu mara ihe-omimi nke ozi ọma, 20 nke m'bu ukọ̀ nime nkpọrọ n'ihi ya; ka m'we kwuwa okwu nime ya, dika m'nāghaghi ikwu. 21 Ma ka unu onwe-unu we mata kwa ihe nile bayerem, otú m'nēme, Tikikọs, onye bu nwa-nna-ayi ahu ahuru n'anya, bu kwa onye kwesiri ntukwasi-obi n'ije-ozi nime Onye-nwe-ayi, ọ gēme ka unu mara ihe nile: 22 onye m'nēzigara unu ime otù ihe a, ka unu we mara otú ihe nāgara ayi, ka o we kasi kwa obi-unu. 23 Udo diri umu-nna-ayi, ya na ihu-n'anya nke ya na okwukwe yikọ, site na Chineke, bú Nna, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist. 24 Ka amara diyere ndi nile huru Onye-nwe-ayi Jisus Kraist n'anya n'emebighi-emebi.

Filipai 1

1 Pọl na Timọti, ndi-orù nke Kraist Jisus, nēdegara ndi nsọ nile nime Kraist Jisus ndi nọ na Filipai akwukwọ, ha na ndi nēlekọta unu anya na ndi nējere unu ozi: 2 Amara diri unu na udo nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist puta. 3 Anamekele Chinekem na ncheta nile m'nēcheta unu, 4 mb͕e nile n'aririọ nile m'nāriọrọ unu nile nāriọ aririọ ahu nime ọṅù, 5 n'ihi nnwekọ unu nwekọrọ n'izisa ozi ọma site n'ubọchi mbu rue ub͕u a; 6 ebe m'tukwasiworo obim n'otù ihe nka, na Onye malitere ilu ezi ọlu nime unu gāluzu ya rue ubọchi Jisus Kraist: 7 dika o ziri ezi ka m'tukwasi uchem n'ihe a bayere unu nile, n'ihi na enwerem unu n'obim, ebe unu nile bu ndi nēsom n'inwekọ amara, ma nime ab͕um ma nime ngọpu nke ozi ọma na ime ka o guzosie ike. 8 N'ihi na Chineke bu onye-àmà nkem, otú agu unu nile nāgusim ike n'obi-ebere nke Kraist Jisus. 9 Nka ka m'nēkpe kwa ekpere, ka ihu-n'anya-unu we nābabiga kwa ókè kari nke-uku nime nmazu na nghọta nile; 10 ka unu we nwa ihe ha na ibe-ha di iche; ka unu we di ọcha n'obi ghara kwa isu ngọngọ rue ubọchi nke Kraist; 11 ebe unu gābu ndi juputaworo na nkpuru nke ezi omume, nke sitere n'aka Jisus Kraist, ka Chineke we nwe ebube na otuto. 12 Ma anamezube ka unu mara, umu-nnam, na, kama ihe ọzọ, ọnọdum emewo ka ozi ọma ga n'iru; 13 ya mere ab͕um putara ìhè nime Kraist na Pritoriọm dum, ya na n'ebe ndi nile fọduru nọ; 14 o me kwa ka ndi ka n'ọnu-ọgugu n'etiti umu-nna nime Onye-nwe-ayi nwebiga anya-ike ókè ikwu okwu Chineke nātughi egwu, ebe ha tukwasiworo obi site n'ab͕um. 15 Ọ bu ezie na ufọdu nēkwusa Kraist-ayi ọbuná n'ihi ekworo na esem-okwu; ma ufọdu nēkwusa kwa Ya n'ihi na ọ di ha ezi nma: 16 ndia nēme ya site n'ihunanya, ebe ha matara na edorom ka m'we gọpu ozi ọma: 17 ma ndi ahu nēkwusa Kraist-ayi site n'ikpa-iche-iche, ọ bughi n'idi-ọcha-n'obi, ebe ha nēchè na ha gēwelirim nkpab͕u n'ab͕um. 18 Gini kwa? ọ bu nání na n'uzọ ọ bula, ma ọ bu n'aghughọ ma-ọbu n'ezi-okwu, anēkwusa Kraist; nime nka ka m'nāṅuri kwa ọṅu, e, m'gāṅuri kwa ọṅu nime ya. 19 N'ihi na amataram na nka gēme ka m'nwe nzọputa, site n'aririọ-unu na nnyezu nke Mọ nke Jisus Kraist, 20 dika olile-anya siri ike na ntukwasi-obi nkem si di, na n'ihe ọ bula ọ dighi ihere gēmem, kama na agēme kwa ka Kraist di uku n'arum ub͕u a, otú ọ di mb͕e nile, ma ọ bu site na ndu, ma-ọbu site n'ọnwu, nime nkwuwa-okwu nile. 21 N'ihi na n'ebe m'nọ idi ndu bu Kraist, inwu anwu bu kwa urù. 22 Ma ọ buru na idi ndu n'anu-aru bu òkèm, nka bu nkpuru nke ọlum: ihe m'gārọputa kwa amaghi m. 23 Ma anọm n'ebe di nkpà n'etiti ihe abua ndia, ebe agu ila na inọ n'ebe Kraist nọ nāgum; n'ihi na ọ kachasi nma nke-uku: 24 ma inọgide n'anu-aru dikariri nkpà n'ihi unu. 25 Ebe m'tukwasiworo obi m n'ihe a, amataram na m'gānọgide, nọgide kwa n'etiti unu nile, ime ka unu ga n'iru ṅu kwa ọṅù nke okwukwe; 26 ka inya-isi-unu we babiga ókè nime Kraist Jisus n'arum site n'ọbibia m'gābiakute unu ọzọ. 27 Nání nēbinu obi dika ndi ala elu-igwe n'uzọ kwesiri ozi ọma nke Kraist: ka ọ gābu, ma m'bia hu unu ma-ọbu na anọghm, ka m'we nu ihe bayere ọnọdu-unu, na unu nēguzosi ike n'otù Mọ Nsọ, nēwere kwa otù nkpuru-obi lukọrọ okwukwe nke ozi ọma ahu ọ̀gù si-ike; 28 ghara ikwe ka ndi nēmegide unu me ka unu tua ujọ n'ihe ọ bula: ebe nke ahu bu ihe nēme ka ila-n'iyì putara ha ìhè, ma ọ nēme ka nzọputa-unu puta ìhè, nka site-kwa-ra na Chineke; 29 n'ihi na unu ka enyeworo ya n'amara n'ihi Kraist, ọ bughi nání ikwere na Ya, kama ihu kwa ahuhu n'ihi Ya: 30 ebe unu nwere otù nb͕a ahu nke unu huru n'arum, ub͕u a ka unu nānu kwa na ọ di n'arum.

Filipai 2

1 Ya mere ọ buru na nkasi-obi ọ bula di nime Kraist, ọ buru na ngugu-obi ọ bula nke ihu-n'anya di, ọ buru na nnwekọ ọ bula nke Mọ Nsọ di, ọ buru na obi-ebere na ime-ebere ọ bula di, 2 menu ka ọṅùm juputa, ka unu we tukwasi uche-unu n'otù ihe ahu, nwe kwa otù ihunanya ahu, nēnwekọ otù nkpuru-obi, nēnwe otù uche; 3 unu emela ihe ọ bula n'uzọ ikpa-iche-iche ma-ọbu n'uzọ ichọ otuto efu, kama n'obi di ume-ala nāguritanu ibe-unu na ndi ka unu onwe-unu nma; 4 unu nile n'otù n'otù elela ihe nke aka unu anya, kama unu nile n'otù n'otù le kwa ihe nke madu-ibe-unu anya. 5 Nwenu uche a nime onwe-unu, nke di kwa nime Kraist Jisus: 6 Onye, ọ bu ezie na Ọ diri n'udi nke Chineke na mbu, ma Ọ gughi ya n'ihe O gējidesi ike, bú ira ka Chineke, 7 kama O mere Onwe-ya ihe-efu, n'inara udi nke orù, ewe me Ya n'oyiyi nke madu; 8 ebe ahuru Ya ka Ọ di ka madu n'oyiyi-Ya, O wedakwara Onwe-ya, we buru Onye nāṅa nti rue ọnwu, bú ọnwu nke obe. 9 N'ihi nka Chineke welikwara Ya elu nke-uku, were kwa amara nye Ya aha ahu nke kariri aha nile ọ bula elu; 10 ka ọ gābu n'aha Jisus ka ikperè nile we b͕ue n'ala, nke ihe nile di n'elu-igwe na ihe nile di n'elu uwa na ihe nile di n'okpuru ala, 11 ka ire nile ọ bula we kwuputa kwa na Jisus Kraist bu Onye-nwe-ayi, ka ewe nye Chineke, bú Nna, otuto. 12 Ya mere, ndi m'huru n'anya, dika unu ṅara nti mb͕e nile, ọ bughi nání mb͕e m'nọ n'etiti unu, kama ub͕u a mb͕e m'nānọghi, werenu egwu na ima-jijiji luputa kari nzọputa nke onwe-unu nke-uku; 13 n'ihi na ọ bu Chineke Onye nālusi ọlu ike nime unu ichọ-achọ-unu na ilusi-ọlu-ike-unu, n'ihi na ọ di Ya ezi nma. 14 Menu ihe nile nējighi ntamu na iru-uka ọ bula; 15 ka unu we ghọ ndi nādighi ita uta ndi nāghọghi kwa aghughọ, umu Chineke ndi anāpughi ita uta n'etiti ọb͕ọ b͕agọrọ ab͕agọ nke nēnwe kwa anya-uhie, ndi anāhu unu n'etiti ha dika ndi nēnye ìhè n'uwa, 16 nēche okwu nke ndu n'iru madu; ka m'we nwe ihe inya isi nye n'ubọchi nke Kraist, na ab͕aghi m ọsọ n'efu, na adọb͕ughkwam onwem n'ọlu n'efu 17 E, ọ buru kwa na anāwusim dika àjà-ihe-ọṅuṅu n'elu àjà na ifè-òfùfè nke okwukwe-unu, anamaṅuri ọṅu, so kwa unu nile nāṅuri ọṅu: 18 n'otù uzọ ahu unu onwe-unu, ṅuri-kwa-nu ọṅu, sokwam nāṅuri ọṅu. 19 Ma anamele anya nime Onye-nwe-ayi Jisus na m'gēzigara unu Timọti ọsọsọ, ka mu onwem we nwe kwa obi-utọ, mb͕e m'mara ọnọdu-unu. 20 N'ihi na enweghi m onye ọ bula nke nkpuru-obi-ya yiri nke ya, bú onye gēcheb͕u onwe-ya bayere ọnọdu-unu n'ezie. 21 N'ihi na ha nile nāchọ ihe nke aka ha, ọ bughi ihe nke Jisus Kraist, 22 Ma unu mara ọnwunwa-ya, na, dika nwa nēso nna-ya, otú a ka o sorom buru orù n'izisa ozi ọma. 23 Ya mere, onye a ka m'nēle anya na m'gēziga ya n'otù oge ahu, mb͕e ọ bula m'gāhu otú ọ gādirim: 24 ma anamatukwasi obim nime Onye-nwe-ayi na mu onwem gābia kwa ọsọsọ. 25 Ma anamagu ya ihe di nkpà izigara unu Epafrọdaitọs, bú nwa nna m na onye mu na ya nālukọ ọlu, onye mu na ya nēbukọ kwa agha, onye buru kwa onye-ozi-unu na onye nēfè òfùfè ib͕o nkpàm; 26 ebe agu unu nile nāgusi ya ike, obi lọ-kwa-ra ya miri, n'ihi na unu nuru na aru-ya adighi ike: 27 n'ihi na aru-ya adighi ike n'ezie, ọ nọ kwa nso ọnwu: ma Chineke mere ya ebere; ma ọ bughi nání ya onwe-ya, kama mu onwem kwa, ka m'we ghara inwe ihe-nwuta n'elu ihe-nwuta. 28 Ya mere ọ nānukarim ọku n'obi iziga ya, ka ọ gābu, mb͕e unu huru ya ọzọ, ka unu we ṅuria ọṅu, ka mu onwem we nwe kwa ihe-nwuta nke dikariri ntà. 29 Ya mere werenu ọṅù nile nara ya nke-ọma nime Onye-nwe-ayi; nāsọpuru-kwa-nu ndi di otú a: 30 n'ihi na ọ bu n'ihi ọlu Kraist ka ọ biaruru ọnwu nso, nēkwere itufu ndu-ya, ka o we mezu ihe fọduru unu ime n'ifè-òfùfè-unu n'ebe m'nọ.

Filipai 3

1 Nke fọduru, umu-nnam, nāṅurinu ọṅu nime Onye-nwe-ayi. Idegara unu otù ihe ndia n'akwukwọ, n'ezie ọ bughi ihe-nsob͕u n'ebe m'nọ, ma n'ebe unu nọ ọ bu ihe-ntukwasi-obi. 2 Lezienu nkita ahu nile anya, lezienu ndi-ọlu ọjọ ahu anya, lezienu obibì-aru ahu anya: 3 n'ihi na ayi onwe-ayi bu ndi obibì-úgwù, ndi ji Mọ nke Chineke nēkpe ekpere, ndi nānya kwa isi nime Kraist Jisus, ndi natukwasighi kwa obi n'anu-aru-ayi: 4 ọ bu ezie na mu onwem puru itukwasi obi ọbuná n'anu aru: ọ buru na onye ọ bula ọzọ nēchè na ya puru itukwasi obi n'anu-aru, mu onwem puru itukwasi obi n'anu-aru kari: 5 ebìrim úgwù n'ubọchi nke-asatọ, esiterem n'umu Israel, site kwa n'ebo Benjamin, abum onye-Hibru nke sitere na ndi-Hibru; n'akuku iwu, abumri onye-Farisi; 6 n'akuku inu-ọku-n'obi, anamesob͕uri nzukọ Kraist; n'akuku ezi omume nke di nime iwu, ahuru na adighi m ita uta. 7 Otú ọ di, ihe ọ bula nke baram urù, ihe ndia ka m'guru n'ihe-iyì n'ihi Kraist-ayi. 8 E, tukwasi kwa, anamagu kwa ihe nile n'ihe-iyì n'ihi ọkika nke ọmuma Kraist Jisus, bú Onye-nwem: Onye m'yiri iyì ihe nile nkem n'ihi Ya, anamagu kwa ha n'ihe-nkpofu, ka m'we rita Kraist n'urù, 9 ewe hum nime Ya, nēnweghi ezi omume ọ bula nke akam, bú nke sitere n'iwu, kama nēnwe ezi omume ahu nke okwukwe ekwere na Kraist nēweta, bú ezi omume ahu nke sitere na Chineke n'elu okwukwe: 10 ka m'we mara Ya, na ike nke nbilite-n'ọnwu-Ya, na nnwekọ nke ahuhu-Ya nile, n'ihi na anēme ka mu na Ya nwekọ otù udi n'ọnwu-Ya; 11 ọ buru na uzọ ọ bula di m'gēsi ru isi na ndi nwuru anwu bilite. 12 Ọ bughi na anataram ya-ri, ma-ọbu na emewom ka m'zue okè ub͕u a: ma anamab͕aso, ka m'we jide, ma ọ buru na ọ gēkwem, ihe ahu nke Kraist Jisus jide-kwa-ram n'ihi ya. 13 Umu-nnam, mu onwem agughi onwem na ejidewom rue ub͕u a: ma otù ihe ka m'nēme, ebe m'nēchezọ ihe nile di n'azu, nēsetipu kwa aka n'ebe ihe nile di n'iru di, 14 anamab͕akuru ókè ib͕a-ọsọ ka m'we nata ihe anāb͕ata n'ọsọ nke ọkpukpọ di elu nke Chineke nime Kraist Jisus. 15 Ya mere, ka ayi ra, bú ndi tozuru okè, ka ayi tukwasi uche na nka: ọ buru kwa na unu tukwasi uche n'ihe ọ bula n'uzọ di iche, ọbuná nka ka Chineke gēkpughere unu: 16 náni nka, n'ihe ahu ayi b͕aruru, ka ayi nāgazi dika ihe ahu si di. 17 Umu-nnam, dinu n'otù n'iṅomim, nēle-kwa-nu ndi nējeghari otú a, otú unu nwere ayi dika ihe-atù 18 N'ihi na ọtutu nējeghari, ndi m'nāgwari unu okwu bayere ha ọtutu oge, ma ub͕u a ọ bu kwa n'ákwá ka m'nāgwa unu, na ha bu ndi-iro obe nke Kraist: 19 ndi ọgwugwu-ha bu ila-n'iyì, ndi chi-ha bu afọ-ha, ndi otuto-ha di kwa n'ihere-ha, ndi nātukwasi uche n'ihe uwa. 20 N'ihi na ala-ayi di n'elu-igwe ub͕u a; site n'ebe ayi nēchesi kwa Onye-nzọputa ike, bú Onye-nwe-ayi Jisus Kraist: 21 Onye gēme aru nke ọnọdu-ayi di ala ka o nwe oyiyi ọhu, ka ya na aru nke ebube-Ya we nwekọ otù udi, dika ilusi-ọlu-ike ahu si di nke O ji pu ọbuná ido ihe nile n'okpuru Onwe-ya.

Filipai 4

1 Ya mere, umu-nnam m'huru n'anya ndi agu unu nāgusikwam ike, ọṅùm na okpu-ezem, guzosienu ike otú a nime Onye-nwe-ayi, ndi m'huru n'anya. 2 Ariọm Yuodia, ariọkwam Sintiki, ka ha tukwasi uche n'otù ihe ahu nime Onye-nwe-ayi. 3 E, ariọkwam gi, onye ekekọtaworo mu na gi n'ezie n'ọlu Chineke, yere ndinyom ahu aka, n'ihi na mu na ha b͕akọsiri nb͕a ike n'ozi oma, gi na Klement, na ndi fọduru mu na ha nālukọ ọlu, ndi aha-ha di n'akwukwọ nke ndu. 4 Nāṅurinu ọṅu n'Onye-nwe-ayi mb͕e nile: m'gāsi ọzọ, Nāṅurinu ọṅu. 5 Menu ka madu nile mara obi-ọma-unu. Onye-nwe-ayi nọ nso. 6 Unu echeb͕ula onwe-unu n'ihe ọ bula; kama n'ihe nile ọ bula site n'ekpere na aririọ, ya na ekele, menu ka Chineke mara ihe nile unu nāriọ. 7 Udo nke Chineke, nke kachasi uche nile, gēche kwa obi-unu na èchìchè-uche-unu nche nime Kraist Jisus. 8 Nke fọduru, umu-nnam, ka ihe bu ezi-okwu ra, ka ha ra, bú ihe kwesiri nsọpuru, ka ha ra, bú ihe ziri ezi, ka ha ra, bú ihe di ọcha, ka ha ra, bú ihe kwesiri ihu-n'anya, ka ha ra, bú ihe ekwuru nke-ọma; ọ buru na idi-nma ọ bula di, o buru kwa na otuto ọ bula di, nāgukọnu ihe ndia. 9 Ihe unu matara, nke unu nata-kwara, nke unu nu-kwa-ra, nke unu hu-kwa-ra n'arum, nēmenu ihe ndia: Chineke nke udo gānọyere kwa unu. 10 Ma aṅuri rim ọṅu nke-uku nime Onye-nwe-ayi, na ub͕u a n'oge a unu malitere ọhu itukwasi uche n'ihe bayerem; nke unu nātukwasiri uche-unu nime ya n'ezie, ma unu enweghi oghere. 11 Ọ bughi na anamekwu okwu bayere nkpà: n'ihi na mu onwem mutara, n'ọnọdu ọ bula m'nọ, inwezu nime ya ihe nile nākpam nkpà. 12 Amataram uzọ iweda onwem, amata-kwa-ram uzọ ibabiga ókè: n'ihe ọ bula na n'ihe nile ezíwo mu ihe-omimi a, bú inọ n'afọ-ojuju na inọ kwa n'agu, ibabiga ókè na inọ kwa na nkpà. 13 Enwerem ike n'ihe nile nime Onye ahu Nke nēmem ka m'di ike. 14 Otú ọ di, unu mere nke-ọma, n'isom nwekọ nkpab͕um. 15 Ma unu onwe-unu makwara, ndi Filipai, na nime nmalite nke ozi ọma, mb͕e m'siri na Masedọnia puta, ọ dighi nzukọ Kraist ọ bula nke mu na ya nwekọrọ ihe n'okwu bayere onyinye na ọnina, ma-ọbughi nání unu onwe-unu; 16 n'ihi na ọbuná na Tesalọnaika unu zigara otù mb͕e ziga kwa mb͕e ọzọ ib͕om nkpà. 17 Ọ bughi na anamachọ onyinye ahu; kama anamachọ nkpuru ahu nke nāba uba iguyere unu. 18 Ma enwezuwom ihe nile, anamababiga kwa ókè: emewo ka m'zue ezù, ebe m'natara n'aka Epafrọdaitọs ihe nile si n'aka-unu bia, isisì nke ihe ísì utọ, àjà nke anānara nke-ọma, nke nātọ Chineke ezi utọ. 19 Ma Chinekem gēnyezu unu ihe nile ọ bula nākpa unu dika àkù-Ya n'ebube si di, nime Kraist Jisus. 20 Ma otuto diri Chineke-ayi, bú Nna-ayi, rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen. 21 Kelenu onye nsọ ọ bula nime Kraist Jisus. Umu-nna-ayi ndi mu na ha nọ nēkele unu. 22 Ndi nsọ nile nēkele unu, ma ndi nke èzí-na-ulo Sisa kachasi n'ikele unu. 23 Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist dinyere mọ-unu.

Kọlọsi 1

1 Pọl, onye-ozi nke Kraist Jisus site n'ọchichọ Chineke, na Timọti nwa-nna-ayi, 2 nēdegara ndi nọ na Kọlọsi akwukwọ, bú umu-nna-ayi nime Kraist ndi di nsọ kwe-kwa-ra ekwe: Amara diri unu na udo nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, puta. 3 Ayí nēkele Chineke, bú Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, nēkpe ekpere bayere unu mb͕e nile, 4 ebe ayi nuru okwu bayere okwukwe nke unu kwere na Kraist Jisus, na ihu-n'anya unu ji hu ndi nsọ nile, 5 n'ihi olile-anya ahu nke edebeworo unu n'elu-igwe, nke unu nuru ihe bayere ya na mbu n'okwu nke ezi-okwu nke ozi ọma, 6 nke biaruru unu; dika ọ nāmiju kwa nkpuru n'uwa nile, nāba kwa uba, dika ọ nēme kwa n'etiti unu, site n'ubọchi unu nuru mazu kwa amara Chineke n'ezi-okwu; 7 dika unu mutara n'ọnu Epafras orù-ibe-ayi onye ayi huru n'anya, onye bu onye kwesiri ntukwasi-obi n'ijere Kraist ozi n'ọnọdu ayi, 8 onye gosi-kwa-ra ayi ihun-anya-unu nime Mọ Nsọ. 9 N'ihi nka ayi onwe-ayi kwa, site n'ubọchi ayi nuru ya, ayi ewepughi aka n'ikpe ekpere na iriọ aririọ n'ihi unu, ka ewe me ka unu juputa na nmazu nke ihe Ọ nāchọ nime amam-ihe na nghọta nile nke Mọ Nsọ, 10 ka unu jegharia n'uzọ kwesiri Onye-nwe-ayi ime otú ọ gātọ Ya utọ n'uzọ nile, nāmi nkpuru n'ezi ọlu nile ọ bula, nāba kwa uba nime nmazu nke Chineke; 11 ebe anēme ka unu di ike nime ike nile, dika ike nke ebube-Ya si di, rue ntachi-obi na ogologo-ntachi-obi nile, ya na ọṅù; 12 nēkele Nna-ayi, Onye mere ka ayi rue iketa òkè-ayi n'ihe-nketa ndi nsọ n'ìhè; 13 Onye dọputara ayi n'ike nke ọchichiri, we webiga ayi n'ala-eze nke Ọkpara nke ihu-n'anya-Ya; 14 Onye ayi nwere nb͕aputa-ayi nime Ya, bú nb͕aghara nmehie nile ayi: 15 Onye bu onyinyo nke Chineke ahu Nke anāpughi ihu anya, buru kwa onye eburu uzọ mu n'ihe nile ekère èkè; 16 n'ihi na nime Ya ka ekère ihe nile, nke di nime elu-igwe na nke di n'elu uwa, ihe apuru ihu anya na ihe anāpughi ihu anya, ma ọ bu oche-eze, ma-ọbu ibu-ndi-nwe-madu, ma-ọbu ibu-ndi-isi, ma-ọbu ichi-isi; esitewo n'aka-Ya kè ihe nile, ekèwo-kwa-ra Ya ihe nile; 17 Ya onwe-ya bū kwa ihe nile uzọ, ọ bu kwa nime Ya ka ihe nile nēguzokọ n'otù. 18 Ya onwe-ya bu kwa isi aru, nke bu nzukọ-Ya: ebe Ọ bu Onye-nmalite, Onye eburu uzọ mu site na ndi nwuru anwu; ka ewe me ka Ya onwe-ya buru onye mbu n'ihe nile. 19 N'ihi na ọ buri ihe di Nna-Ya ezi nma ka ozuzù nile bigide nìme Ya; 20 ka O we site kwa n'aka-Ya me ka Ya onwe-ya na ihe nile di n'otù, ebe O sitesiri n'ọbara nke obe-Ya me ka Ya onwe-ya na madu di n'udo; site n'aka-Ya, ka m'kwuru, ma ọ bu ihe di n'elu uwa, ma-ọbu ihe di n'elu-igwe. 21 Unu onwe-unu kwa, ọ bu ezie na emereri unu ka unu buru ndi ala ọzọ n'oge gara aga, buru kwa ndi-iro n'èchìchè-uche-unu nime ajọ ọlu nile unu, ma ub͕u a ka O mere ka unu na Ya di n'otù 22 nime aru nke anu-aru-Ya, site n'ọnwu-Ya, iche unu n'iru Ya dika ndi di nsọ, ndi anāpughi kwa ita uta, ndi anāpughi kwa ibo ebubo: 23 ma asi na ọ bu ezie na unu anọgide n'okwukwe-unu, ndi atọworo ntọ-ala, ndi nēguzosi kwa ike, ndi anādighi-ewepu kwa n'olile-anya nke ozi ọma ahu nke unu nuru, nke ekwusara n'etiti ihe nile ekère èkè nke di n'okpuru elu-igwe; nke emere mu onwem, bú Pọl, onye nēje ozi ya. 24 Ub͕u a anamaṅuri ọṅu n'ahuhu m'nāhu n'ihi unu, anamemezu kwa n'akuku nkem ihe fọduru na nkpab͕u nile nke Kraist-ayi n'anu-arum n'ihi aru-Ya, nke bu nzukọ-Ya; 25 nke emere mu onwem onye nējere ya ozi, dika ọlu ọchichi-èzí-na-ulo nke Chineke si di nke enyerem n'ebe unu nọ, ikwuzu okwu Chineke, 26 bú ihe-omimi nke ezoworo ezo site n'oge nile site kwa n'ọb͕ọ nile: ma ub͕u a ka emere ya ka ọ puta ìhè nye ndi nsọ Ya, 27 ndi Chineke chọrọ ime ka ha mara ihe bu àkù nke ebube nke ihe-omimi a n'etiti ndi mba ọzọ, nke bu Kraist nime unu, bú olile-anya nke ebube ahu: 28 Onye ayi nēkwusa, nādu madu nile ọ bula ọdú, nēzí kwa madu nile ọ bula n'amam-ihe nile, ka ayi we che madu nile ọ bula n'iru Onye-nwe-ayi dika ndi zuru okè nime Kraist; 29 anamadọb͕u kwa onwem n'ọlu ime ihe a, nāb͕asi nb͕a ike dika i1usi-ọ1u-ike nke Ya si di, nke nālusi ike nimem n'ike.

Kọlọsi 2

1 N'ihi na anamachọ ka unu mata otú m'nāb͕asi nb͕a ike nke-uku n'ihi unu na ndi bi na Leọdisia na ka ha ra, bú ndi akāhughi irum n'anu-aru; 2 ka ewe kasie obi-ha, ebe ejikọ-kwa-ra ha n'ihu-n'anya, ka ha we ru kwa àkù nile nke nkwezu ahu nke nghọta nēkwezu, ka ha we mazu ihe-omimi nke Chineke, bú Kraist, 3 Onye àkù nile nke amam-ihe na ihe-ọmuma di nime Ya, bú ihe zoro ezo nime Ya. 4 Nka ka m'nēkwu, ka onye ọ bula we ghara iwere ire-utọ rafue unu. 5 N'ihi na ọ bu ezie na anọghm n'etiti unu n'anu-arum, ma anọm n'etiti unu na mọm, nāṅuri, nēle kwa usoro-unu na otú okwukwe unu kwere na Kraist di ike. 6 Ya mere dika unu nara Kraist-ayi, bú Jisus Onye-nwe-ayi, nējegharinu nime Ya, 7 buru kwa ndi b͕agideworo nkpọrọgwu nime Ya, ndi anēwuli kwa elu dika ulo nime Ya, ndi anēwere kwa okwukwe-unu me ka unu guzosie ike, dika ezíri unu, nēkelebiga ókè. 8 Lezienu anya ka onye ọ bula ghara iwere ihu-amam-ihe-n'anya na aghughọ efu nke ya buru onye nēzu unu n'ori, ihu-amam-ihe-n'anya nke di ka ihe-ozizí madu nyere idebe, dika ozizí mbu nke uwa, ma ọ dighi ka Kraist si di: 9 n'ihi na nime Ya ka ozuzù nile nke ihe Chineke bu nēbigide nēwere aru madu, 10 nime Ya ka emezuwo-kwa-ra unu emezu, Onye bu isi nke ibu-onye-isi na ichi-isi nile ọ bula: 11 ọ bu kwa nime Ya ka ejiri obibì-úgwù anējighi aka me bì unu úgwù, n'iyipuchasi aru nile nke bu anu-aru, n'obibì-úgwù nke Kraist; 12 ebe elìkọrọ unu na Ya nime baptism-unu, ọ bu kwa nime ya ka esitere n'aka okwukwe-unu me ka unu so Ya bilikọ, bú okwukwe unu kwere n'ilusi-ọ1u-ike nke Chineke, Onye mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie. 13 Unu onwe-unu kwa, mb͕e unu nọ n'ọnwu site na ndahie nile unu na ebìghi-úgwù nke anu-aru-unu, ọbuná unu ka O mere ka unu so Ya dikọ ndu, mb͕e O weresiri amara b͕aghara ayi ndahie-ayi nile; 14 mb͕e O hichapusi-kwa-ra ihe ayi ji aka-ayi de n'akwukwọ ike onwe-ayi ab͕u, nke megidere ayi, bú ihe edere n'iwu nke enyere ayi, nke nēguzogide ayi: O wepuwo kwa ya n'etiti ayi na Ya, nākpọgide ya n'obe-Ya; 15 mb͕e O yipuchasiri n'aru ibu-ndi-isi nile na ichi-isi nile ihe-agha-ha nye Onwe-ya, O were nkwuwa-okwu gosi ha n'iru ọra, nēdughari ha n'ọṅù-agha n'elu obe-Ya. 16 Ya mere, unu ekwela ka onye ọ bula kpo unu n'oriri, ma-ọbu n'ọṅuṅu, ma-ọbu n'okwu ubọchi ememe ma-ọbu nke ọnwa ọhu ma-ọbu nke ubọchi-izu-ike: 17 nke bu onyinyo nke ihe gaje ibia; ma aru bu nke Kraist. 18 Unu ekwela ka onye ọ bula me ihe ọ nāchọ n'ipunara unu ihe unu nāb͕ata n'ọsọ, site n'obi di ume-ala na ikpere ndi-mọ-ozi, nēguzo n'ihe ọ huworo, onye uche nke anu-aru-ya nāfuli elu n'efu, 19 ọ dighi-ejidesi kwa Isi-ayi ike, Onye aru nile, ebe esitere na nkwonkwo-ya na akwara-ya nile nyezu ya ihe jikọ kwa ya n'otù, o sitere na Ya nāba uba nke Chineke. 20 Ọ buru na unu na Kraist nwukọrọ anwu pua n'ihe-ozizí mbu nke uwa, gini mere, dika agāsi na unu nādi ndu n'uwa, unu nēdo onwe-unu n'okpuru iwu di iche iche enyere, 21 Ejidela, edetu-kwa-la ire, emetu-kwa-la aka 22 (bú ihe agēmebi ha nile emebi n'iji ha me ihe), dika ihe enyere n'iwu na ozizí madu si di? 23 Ọ bu ezie na ihe di otú a nwere nke anākpọ amam-ihe n'ikpe ekpere dika madu chọrọ, n'inwe kwa obi di ume-ala, n'ime kwa ka aru hu ahuhu; ma ha abughi ihe di oké ọnu-ahia ma-ọli megide ime ihe ọjọ nke gēju anu-aru afọ.

Kọlọsi 3

1 Ya mere, ọ buru na unu soro Kraist-ayi bilikọ, nāchọnu ihe di n'elu, ebe Kraist-ayi nọ, nānọdu n'aka-nri Chineke. 2 Tukwasinu uche n'ihe di n'elu, ọ bughi n'ihe di n'elu uwa. 3 N'ihi na unu nwuru anwu, ezowo kwa ndu-unu n'ebe Kraist-ayi nọ nime Chineke. 4 Mb͕e ọ bula agēme ka Kraist-ayi puta ìhè, Onye bu ndu-ayi, mb͕e ahu ka agēme kwa ka unu onwe-unu so Ya puta ìhè n'ebube. 5 Ya mere, menu ka ihe nile di unu n'aru nke di n'elu uwa nwua; ikwa-iko, adighi-ọcha, ọchichọ ọjọ, agu ihe ọjọ, na anya-uku ahu, n'ihi na nka bu ikpere arusi; 6 ọ bu kwa n'ihi ihe ndia ka iwe Chineke nābiakwasi umu nke ekweyeghi-ekweye; 7 nke unu onwe-unu jeghariri nime ha n'oge gara aga, mb͕e unu nādi ndu nime ihe ndia. 8 Ma ub͕u a unu onwe-unu, tupu-kwa-nu ihe ndia nile; bú iwe, ọnuma, obi ọjọ, nkwulu, ikwu okwu ihere nēsi n'ọnu-unu puta 9 unu ekwula okwu-ugha gwarita ibe-unu; ebe unu yipuchasiworo madu ochie ahu, ya na omume-ya nile, 10 yikwasi kwa madu ọhu ahu, nke anēme ya ka ọ di ọhu rue na nmazu dika onyinyo nke Onye kère ya si di: 11 ebe onye-Grik na onye-Ju, obibì-úgwù na ebìghi-úgwù, onye nāsu asusu ọzọ, onye Sitia, orù, onye nwere onwe-ya, nāpughi idi: ma Kraist bu ihe nile, di kwa nime madu nile. 12 Ya mere dika ndi Chineke rọputara, ndi di nsọ ndi ahuwo-kwa-ra n'anya, yikwasinu obi ebere, obi-ọma, obi di ume-ala, idi-nwayọ, ogologo-ntachi-obi; 13 nānagideritanu ibe-unu, were-kwa-nu amara b͕aghara onwe-unu, asi na onye ọ bula nwere ihe ita onye ọ bula uta; ọbuná dika Onye-nwe-ayi were amara b͕aghara unu, unu onwe-unu me kwa otú a: 14 ma n'elu ihe ndia nile yikwasinu ihu-n'anya, nke bu ihe-nkekọ nke izu-okè. 15 Ka udo nke Kraist nēkpezi kwa okwu n'obi-unu, nke akpọbata-kwa-ra unu nime ya n'otù aru; buru-kwa-nu ndi nēkele ekele. 16 Kwenu ka okwu Kraist were àkù-ya nile biri nime unu n'amam-ihe nile; werenu abù ọma na ukwe na abù nke Mọ Nsọ nēzírita onwe-unu ihe, nādurita kwa onwe-unu ọdu, nime amara enyere unu nābùnu abù nime obi-unu nye Chineke. 17 Ihe nile ọ bula unu nēme kwa, n'okwu ma-ọbu n'ọlu, nēmenu ha nile n'aha Onye-nwe-ayi Jisus, nēkele Chineke, bú Nna-ayi, site n'aka-Ya. 18 Ndi bu nwunye, nēdonu onwe-unu n'okpuru di-unu, dika ọ nēkwesi unu nime Onye-nwe-ayi. 19 Ndi bu di, hunu nwunye-unu n'anya, unu enwe-kwa-la obi ilu n'ebe ha nọ. 20 Umu, nāṅanu nti okwu ndi muru unu n'ihe nile, n'ihi na nka bu ihe nātọ ezi utọ nime Onye-nwe-ayi. 21 Ndi bu nna, akpasula umu-unu iwe, ka obi ghara ifù ha. 22 Ndi-orù, nāṅanu nti okwu ndi bu ndi-nwe-unu n'uzọ anu-aru n'ihe nile; ghara iwere ibu-orù-n'anya nāṅa, dika ndi nēme otú ọ gātọ madu utọ, kama n'afọ-ofufo, nātu egwu Onye-nwe-ayi: 23 ihe ọ bula unu nēme, nālunu ọlu site na nkpuru-obi-unu, dika unu nāluru Onye-nwe-ayi ọlu, ọ bughi kwa madu; 24 ebe unu matara na ọ bu n'aka Onye-nwe-ayi ka unu gānata ihe-nnyeghachi-unu, bú ihe-nketa ahu: unu bu orù nke Onye-nwe-ayi Kraist. 25 N'ihi na onye nēme ajọ omume gānaghachi ajọ omume ahu o mere: ile-madu-anya-n'iru adighi kwa.

Kọlọsi 4

1 Ndi-nwe madu, nēnye-kwa-nu ndi-orù-unu ihe ziri ezi na nke ra nrata; ebe unu matara na unu onwe-unu nwe-kwa-ra otù Onye Nke bu Onye-nwe-unu n'elu-igwe. 2 Nānọgidesinu ike n'ekpere-unu, nāmu-kwa-nu anya nime ya n'ikele-ekele; 3 nēkpe-kwa-nu ekpere n'ihi ayi n'otù oge ahu, ka Chineke we meghere ayi ọnu-uzọ ikwusa okwu-Ya, ka ayi kwue ihe-omimi nke Kraist, nke m'nọ kwa n'ab͕u n'ihi ya; 4 ka m'we me ka ọ puta ìhè, dika m'nāghaghi ikwu ya. 5 Nējegharinu n'amam-ihe n'ebe ndi nọ n'èzí nọ, nāzuchapuru onwe-unu oge a nile. 6 Ka okwu-unu di n'amara mb͕e nile, ihe eji nnú me ka ọ di utọ, ka unu we mata otú unu nāghaghi iza madu nile ọ bula. 7 Madu nke gēme ka unu mara ihe nile bayere mu onwem bu Tikikọs, onye bu nwa-nna-ayi ahu ahuru n'anya, buru kwa onye kwesiri ntukwasi-obi n'ije-ozi, buru kwa orù-ibem nime Onye-nwe-ayi: 8 onye m'nēzitere unu ime ihe a, ka unu we mara otú ihe nāgara ayi, ka o we kasi kwa obi-unu. 9 Anamezite kwa Ọnisimọs, bú nwa-nna-ayi ahu kwesiri ntukwasi-obi, onye ahu-kwa-ra n'anya, onye bu otù onye n'etiti unu. Ha gēme ka unu mara ihe nile nke anēme n'ebe a. 10 Aristakọs onye adọkọrọ mu na ya n'agha nēkele unu, ya na Mak nwa-nne Banabas (onye unu natara ihe ufọdu enyere n'iwu bayere ya; asi na ọ biakute unu, naranu ya nke-ọma), 11 Jisus kwa, onye anākpọ Justọs, madu atọ ndia sitere n'obibì-úgwù: nání ndia bu ndi sorom nālukọ ọlu n'ikwusa ala-eze Chineke, madu ndi emere ka ha burum ndi-ngugù-obi. 12 Epafras, onye bu otù onye n'etiti unu, orù nke Kraist Jisus, nēkele unu, nāb͕asi nb͕a ike n'ihi unu n'ekpere-ya nile mb͕e nile, ka unu we guzo dika ndi zuru okè ndi kwezuwo-kwa-ra ihe nile Chineke nāchọ. 13 N'ihi na anamab͕ara ya àmà, na ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu nke-uku nye unu na ndi nọ na Leọdisia na ndi nọ na Hierapọlis. 14 Luk, bú dibia nke ahuru n'anya, nēkele unu, ya na Dimas. 15 Kelenu umu-nna-ayi ndi nọ na Leọdisia, na Nimfas, na nzukọ Kraist nke di n'ulo-ha. 16 Ma mb͕e ọ bula agāgusi akwukwọ-ozi a n'etiti unu, menu ka agu kwa ya na nzukọ Kraist nke ndi Leọdisia; lezi-kwa-nu anya ka unu onwe-unu gu kwa akwukwọ ozi ahu si na Leọdisia bia. 17 Ọzọ, sinu Akipọs, Lezie ije-ozi nke i natara nime Onye-nwe-ayi anya, ka i jezu ya. 18 Ekele nke mu Pọl, nke m'ji aka nkem de. Chetanu ab͕um. Ka amara diyere unu.

1 Tesalọnaika 1

1 Pọl na Silvanọs na Timọti nēdegara nzukọ nke ndi Tesalọnaika nime Chineke, bú Nna, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, akwukwọ: Amara diri unu, ya na udo. 2 Ayi nēkele Chineke ekele mb͕e nile bayere unu nile, nēcheta unu mb͕e ayi nēkpe ekpere; 3 ebe ayi nēcheta nēwepughi aka ọlu nke okwukwe unu na ndọb͕u-n'ọlu nke ihunanya unu na ntachi-obi nke olile-anya unu ji ele anya Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, n'iru Chineke-ayi, bú Nna-ayi; 4 ebe ayi matara, umu-nna-ayi ndi Chineke huru n'anya, i rọputa unu, 5 na ọ bughi nání n'okwu-ọnu ka ozi ọma ayi biaruru unu, kama ọ bia-kwa-ra n'ike, na nime Mọ Nsọ na ọtutu nkwezu; dika unu matara aha madu a huru na ayi bu n'ebe unu nọ n'ihi unu. 6 Unu onwe-unu ghọchikwara ndi nēṅomi ayi na Onye-nwe-ayi, ebe unu were ọṅù nke Mọ Nsọ nara okwu ahu nke-ọma nime ọtutu nkpab͕u; 7 ya mere unu ghọrọ ihe-atù n'ebe ha nile, nọ, bú ndi kwere ekwe nime Masedọnia na nime Akaia. 8 N'ihi na okwu nke Onye-nwe-ayi esiwo n'aru-unu daputa udà, ọ bughi nání na Masedọnia na Akaia, kama n'ebe nile ọ bula okwukwe-unu n'ebe Chineke nọ aputawo ìhè; ya mere ọ dighi ayi nkpà ikwu okwu ọ bula. 9 N'ihi na ha onwe-ha nākọ akukọ bayere ayi aha nbata ayi batara n'ebe unu nọ; ya na otú unu siri n'arusi chigharikute Chineke, ibu orù Chineke Nke di ndu Nke bu kwa onye-ezi-okwu, 10 na ichere Ọkpara-Ya Onye gēsi n'elu-igwe bia, Onye O mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, bú Jisus, Onye nādọputa ayi n'iwe nke nābia.

1 Tesalọnaika 2

1 N'ihi na unu onwe-unu matara, umu-nna-ayi, nbata ayi batara n'ebe unu nọ, na ahuwo na ọ bughi ihe-efu: 2 kama ọ bu ezie na ayi hururi ahuhu na mbu, eme kwa ayi ihe-ihere, dika unu matara, na Filipai, ma ayi kwuwara okwu nime Chineke-ayi igwa unu ozi ọma Chineke n'oké nb͕a. 3 N'ihi na aririọ ayi nāriọ unu esighi na njehie puta, o sighi kwa n'adighi-ọcha, ọ bughi kwa n'aghughọ: 4 kama dika Chineke nwaputaworo ayi ka enye ozi ọma Ya n'aka-ayi na ntukwasi-obi idebe, otú a ka ayi nēkwu; ọ bughi dika ndi nēme ihe gātọ madu utọ, kama dika ndi nēme ihe gātọ Chineke utọ, bú Onye nānwa obi-ayi. 5 N'ihi na ọ dighi mb͕e ọ bula ahuru ayi n'ikwu okwu nrafu, dika unu matara, ma-ọbu n'iwere aghughọ b͕achita anya-uku, Chineke bu onye-àmà; 6 ma-ọbu n'ichọ otuto site na madu, ma-ọbu n'aka-unu, ma-ọbu n'aka ndi ọzọ, mb͕e ayi puru idi ka ibu arọ́, dika ndi-ozi Kraist. 7 Kama ayi ghọrọ ndi di nwayọ n'etiti unu, dika mb͕e nwanyi nke nāzù nwa nēlezi umu nke aka ya anya nke-ọma: 8 otú a, ebe unu di ayi n'obi nke-uku, ọ diri ayi ezi nma ime ka unu keta, ọ bughi nání ozi ọma nke Chineke, kama ọ bu kwa nkpuru-obi nke aka ayi, n'ihi na emere ka unu buru ndi ayi huru n'anya. 9 N'ihi na unu nēcheta, umu-nna-ayi, ndọb͕u ayi nādọb͕u onwe-ayi n'ọlu na ihuju-anya-ayi: n'ihi na ayi nālu ọlu abali na ehihie, ka ayi we ghara ibob͕u onye ọ bula nime unu, ayi we kwusara unu ozi ọma nke Chineke. 10 Unu onwe-unu bu ndi-àmà, Chineke bu kwa onye-àmà, otú ahuru ayi na ayi bu ndi di ọcha n'obi na ndi ezi omume na ndi nādighi ita uta n'ebe unu nọ, bú ndi kwere ekwe: 11 ọbuná dika unu matara otú ayi mere madu nile ọ bula nime unu, dika nna si emere umu nke aka ya, nāriọ unu, nākasi kwa unu obi, nāgwasi kwa unu okwu ike, 12 ka unu we nējeghari dika ọ kwesiri Chineke, Onye nākpọbata unu n'ala-eze na ebube nke aka Ya. 13 Ọ bu kwa n'ihi nka ka ayi onwe-ayi nēkele kwa Chineke nēwepughi aka, na, mb͕e unu natara okwu nke unu nuru n'ọnu-ayi, bú okwu nke Chineke, ọ bughi okwu madu ka unu nara nke-ọma, kama, otú ọ di n'ezi-okwu, ọ bu okwu Chineke, nke nālusi kwa ọlu ike nime unu ndi kwere ekwe. 14 N'ihi na unu onwe-unu, umu-nna-ayi, ghọrọ ndi nēṅomi nzukọ nile nke Chineke nke di na Judia nime Kraist Jisus: n'ihi na unu onwe-unu hu-kwa-ra otù ahuhu ahu n'aka ndi unu na ha bu otù ala, ọbuná dika ndi ahu huru ahuhu n'aka ndi-Ju; 15 ndi b͕uru Onye-nwe-ayi Jisus na ndi-amuma, chupu kwa ayi, ha bu kwa ndi ihe ha nēme nātọghi Chineke utọ, ha nēmegide kwa madu nile; 16 Na-eb͕ochi ayi igwa ndi mba ọzọ okwu ka ewe zọputa ha; imezu nmehie nile ha mb͕e nile: ma iwe Chineke abiakwasiwo ha rue ọgwugwu-ha. 17 Ma ayi onwe-ayi, umu-nna-ayi, ebe ekewapuru ayi n'aru-unu nwa oge ntà, n'iru, ọ bughi n'obi, ayi were oké agu nubiga ọku ókè n'obi kari ihu iru-unu: 18 n'ihi na ayi chọrọ ibiakute unu, mu onwem, bú Pọl, otù mb͕e na mb͕e ọzọ; Setan b͕ochikwara ayi. 19 N'ihi na gini bu olile-anya-ayi, ma-ọbu ọṅù-ayi, ma-ọbu okpu-eze nke inya-isi ayi? Ọ̀ bughi kwa unu onwe-unu, n'iru Onye-nwe-ayi Jisus n'ọbibia-Ya? 20 N'ihi na unu onwe-unu bu otuto-ayi na ọṅù-ayi.

1 Tesalọnaika 3

1 N'ihi nka mb͕e ayi nāpughi inagide ọzọ, ọ di ayi ezi nma ka arapu nání ayi n'azu n'Atens; 2 ayi we ziga Timọti, nwa-nna-ayi na onye nējere Chineke ozi n'ozi ọma nke Kraist, ka o we me ka unu guzosie ike, ka o we kasi kwa unu obi n'ihi okwukwe-unu; 3 ka ewe ghara ikwaghari onye ọ bula nime nkpab͕u ndia; n'ihi na unu onwe-unu matara na ọ bu n'ihi nka ka edoro ayi. 4 N'ihi na n'ezie, mb͕e ayi nọ n'etiti unu, ayi buru uzọ nāgwa unu na agaje ikpab͕u ayi; ọbuná dika o mere, dika unu matakwara. 5 N'ihi nka mu onwem kwa, mb͕e m'nāpughi idi nānagide ya ọzọ, eziterem ka m'mara okwukwe-unu, ma o nwere uzọ ọ bula onye-ọnwunwa ahu nwarari unu, ndọb͕u ayi dọb͕uru onwe-ayi n'ọlu we ghọ ihe-efu. 6 Ma mb͕e Timọti siri n'ebe unu nọ biakute ayi ọbuná ub͕u a, we zìe ayi ozi ọma bayere okwukwe na ihunanya unu, si kwa na unu nēcheta ayi ezi ncheta mb͕e nile, na agu ihu ayi anya nāgusi kwa unu ike, ọbuná dika ọ nāgu kwa ayi onwe-ayi ihu unu; 7 n'ihi nka, umu-nna-ayi, akasiri ayi obi n'ihi unu nime nkpà-ayi nile na nkpab͕u-ayi nile site n'okwukwe-unu: 8 n'ihi na ayi di ndu ub͕u a, ọ buru na unu onwe-unu nēguzosi ike nime Onye-nwe-ayi. 9 N'ihi na ekele gini ka ayi puru inyeghachi Chineke bayere unu, n'ọṅù nile ayi ji ṅuria n'ihi unu n'iru Chineke-ayi; 10 abali na ehihie nāriọbiga aririọ ókè nke-uku ri nne ka ayi we hu iru-unu, dochi kwa ihe fọduru n'okwukwe-unu? 11 Ma ka Ya onwe-ya, bú Chineke-ayi na Nna-ayi, Onye-nwe-ayi Jisus, duzi uzọ-ayi rue ebe unu nọ: 12 ka Onye-nwe-ayi me kwa ka unu rie nne babiga kwa ókè n'ihunanya n'ebe ibe-unu nọ, na n'ebe madu nile nọ, ọbuná dika ayi onwe-ayi di n'ebe unu nọ; 13 ka O we me ka obi-unu guzosie ike nādighi ita uta n'idi-nsọ n'iru Chineke-ayi, bú Nna-ayi, n'ọbibia nke Onye-nwe-ayi Jisus, Ya na ndi nsọ Ya nile.

1 Tesalọnaika 4

1 Ya mere nke fọduru, umu-nna-ayi, ayi nēkpere unu, nāriọ kwa unu nime Onye-nwe-ayi Jisus, ka, dika unu natara n'aka-ayi otú unu nāghaghi ijeghari na ime ihe gātọ Chineke utọ, ọbuná dika unu nējeghari, ka unu nābabiga ókè nke-uku kari. 2 N'ihi na unu matara iwu nile ayi nyere unu site n'aka Onye-nwe-ayi Jisus. 3 N'ihi na nka bu ihe Chineke nāchọ, bú ka edo unu nsọ, ka unu ghara ikwa iko; 4 ka onye ọ bula nime unu matara otú ọ gēnwe nwunye nke aka ya n'odido-nsọ na nsọpuru, 5 ọ bughi n'ọchichọ ọjọ nke agu ihe ọjọ, ọbuná dika ndi mba ọzọ ndi nāmataghi Chineke; 6 ka onye ọ bula ghara ighọb͕u na irib͕u nwa-nna-ya n'ihe a: n'ihi na Onye-nwe-ayi bu onye nābọ̀ ọ́bọ̀ bayere ihe ndia nile, dika ayi bu-kwa-ra uzọ gwa unu gwasi kwa unu ike. 7 N'ihi na Chineke akpọghi ayi ka ayi buru ndi nādighi ọcha, kama n'odido-nsọ. 8 Ya mere onye nāju, ọ bughi madu ka ọ nāju, kama ọ bu Chineke, Onye nēnye Mọ Nsọ Ya ka Ọ ba nime unu. 9 Ma ọ dighi unu nkpà ka madu degara unu akwukwọ bayere ihunanya n'ebe umu-nna-unu nọ: n'ihi na unu onwe-unu bu ndi Chineke zíworo ihurita ibe-unu n'anya; 10 n'ihi na unu nēme ya n'ezie n'ebe umu-nna-ayi nile ndi bi na Masedọnia dum nọ. Ma ayi nāriọ unu, umu-nna-ayi, ka unu nābabiga ókè nke-uku kari; 11 ka unu nējisi kwa ike inọdu nwayọ, na ime ihe nile nke aka unu, na iji aka-unu lu ọlu, dika ayi nyere unu iwu; 12 ka unu we nējeghari dika o kwesiri unu n'ebe ha nọ, bú ndi nọ n'èzí, ka ihe ọ bula ghara kwa ikpa unu. 13 Ma ayi achọghi ka unu ghara imara ihe bayere ndi nāda n'ura ọnwu, umu-nna-ayi; ka o we ghara iwuta unu, ọbuná dika ọ nēwuta ndi fọduru, ndi nēnweghi olile-anya. 14 N'ihi na asi na ayi kwere na Jisus nwuru si kwa n'ọnwu bilie, otú a ndi emere ka ha da n'ura ọnwu site n'aka Jisus, ọ bu ndia ka Chineke gēkuru ka ha so Ya bia. 15 N'ihi na nka ka ayi nāgwa unu n'okwu Onye-nwe-ayi, na ayi onwe-ayi, bú ndi nọ na ndu, ndi anārapu rue ọbibia nke Onye-nwe-ayi, na ayi agaghi-eburu ndi dara n'ura onwu uzọ ma-ọli. 16 N'ihi na Onye-nwe-ayi onwe-ya gēwere oké ikpọ-òkù, were olu isi-mọ-ozi, were kwa opì nke Chineke, si n'elu-igwe ridata: ndi nwuru nime Kraist gēbu kwa uzọ si n'ọnwu bilie: 17 mb͕e ahu ayi onwe-ayi, bú ndi nọ na ndu, ndi anārapu, ayi na ha ka agēwelikọ n'igwe-oji, izute Onye-nwe-ayi nime mbara-elu-igwe: otú a ka ayi na Onye-nwe-ayi gānọ kwa mb͕e nile. 18 Ya mere werenu okwu ndia nākasirita ibe-unu obi.

1 Tesalọnaika 5

1 Ma ọ dighi unu nkpà, umu-nna-ayi, ka edegara unu akwukwọ bayere oge ahu nile na ubọchi ahu nile. 2 N'ihi na unu onwe-unu matara nke-ọma na dika onye-ori nābia n'abali, otú a ka ubọchi nke Onye-nwe-ayi nābia. 3 Mb͕e ha nāsi, Udo na ntukwasi-obi di, mb͕e ahu na mberede ka nbili nābiakwasi ha, dika ime nēme nwanyi nke di ime; ha agaghi-ab͕anari kwa ya ma-ọli. 4 Ma unu onwe-unu, umu-nna-ayi, anọghi n'ọchichiri, ka ubọchi ahu we jide unu na mberede dika onye-ori: 5 n'ihi na unu onwe-unu nile bu umu nke ìhè, na umu nke ehihie: ayi abughi ndi nke abali, ma-ọbu nke ọchichiri; 6 ya mere otú a, ka ayi ghara iraru ura, dika ndi fọduru, kama ka ayi nēche nche nwe kwa anya-udo. 7 N'ihi na ndi nāraru ura nāraru ura n'abali; ndi nāṅubiga kwa manya ókè nāṅubiga n'abali. 8 Ma ayi onwe-ayi, ebe ayi bu ndi nke ehihie, ka ayi nwe anya-udo, yikwasikwa ihe-agha ib͕ochi obi, bú okwukwe na ihunanya; ya na okpu-agha, bú ile-anya nzọputa. 9 N'ihi na Chineke edebeghi ayi inata iwe, kama inweta nzọputa site n'aka Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, 10 Onye nwuru n'ihi ayi, ka ọ gābu, ma ayi nēche nche ma ayi nāraru ura, ka ayi we so Ya dikọ ndu. 11 N'ihi nka nākasiritanu ibe-unu obi, wulirita kwa ibe-unu elu dika ulo, dika unu nēme kwa. 12 Ma ayi nēkpere unu, umu-nna-ayi, ka unu mata ndi nādọb͕u onwe-ha n'ọlu n'etiti unu, ndi bu kwa ndi-isi-unu nime Onye-nwe-ayi, ndi nādu kwa unu ọdú; 13 ka unu were kwa ihunanya sọpuru ha gabiga ókè nke-uku ri nne n'ihi ọlu-ha. Birinu n'udo n'etiti onwe-unu. 14 Ma ayi nāriọ unu, umu-nna-ayi, nādunu ndi nādighi-agazi ije ọdú, nakasinu ndi dara #mbà n'obi, nēyerenu ndi nādighi ike aka, nwenu ogologo-ntachi-obi n'ebe madu nile nọ. 15 Lenu ka onye ọ bula ghara inyeghachi onye ọ bula ihe ọjọ n'ọnọdu ihe ọjọ; kama nāb͕asonu ezi ihe mb͕e nile, n'ebe ibe-unu nọ, na n'ebe madu nile nọ. 16 Nāṅurinu ọṅu mb͕e nile; 17 nēkpenu ekpere nēwepughi aka; 18 nēkelenu ekele n'ihe nile ọ bula: n'ihi na nka bu ihe Chineke nāchọ nime Kraist Jisus n'ebe unu nọ. 19 Unu emenyula Mọ Nsọ; 20 unu akpọla ibu-amuma ihe-efu; 21 nānwanu ihe nile; jidesienu ihe ọma ike; 22 unu etiyela aka n'aha ajọ ihe ọ bula. 23 Chineke nke udo, Ya Onwe-ya dozu kwa unu nsọ n'uzọ dum; ka edebezu kwa mọ-unu na nkpuru-obi-unu na aru-unu dum, nādighi ita uta n'ọbibia nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist. 24 O kwesiri ntukwasi-obi, bú Onye ahu nākpọ unu, Onye gēme kwa ya. 25 Umu-nna-ayi, nēkpenu ekpere bayere ayi. 26 Werenu isutu-ọnu di nsọ kele umu-nna-ayi nile. 27 Ewerem Onye-nwe-ayi b͕a unu iyi ka aguara umu-nna-ayi nile akwukwọ-ozi a. 28 Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist dinyere unu.

2 Tesalọnaika 1

1 Pọl na Silvanọs na Timọti nēdegara nzukọ nke ndi Tesalọnaika nime Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, akwukwọ: 2 Amara diri unu na udo nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist puta. 3 Ayi ji ugwọ ikele Chineke ekele mb͕e nile bayere unu, umu-nna-ayi, dika o kwesiri, n'ihi na okwukwe-unu nāba uba nke-uku, ihunanya ahu unu nile n'otù n'otù nāhurita ibe-unu nēri kwa nne; 4 ya mere ayi onwe-ayi nānya isi n'aru unu n'etiti nzukọ Chineke nile n'ihi ntachi-obi-unu na okwukwe-unu nime nsob͕u-unu nile na nime nkpab͕u nile unu nānagide; 5 nke bu ihe nēme ka ikpé ziri ezi nke Chineke puta ìhè; ka ewe gua unu na ndi kwesiri ala-eze Chineke, nke unu nāhu kwa ahuhu n'ihi ya: 6 asi na ọ bu ezie na o ziri ezi n'ebe Chineke nọ inyeghachi ndi nākpab͕u unu nkpab͕u, 7 na inyeghachi unu, bú ndi anākpab͕u, aru-efè, ayi na unu, nime nkpughe nke Onye-nwe-ayi Jisus site n'elu-igwe, Ya na ndi-mọ-ozi nke ike-Ya, 8 nime ọku nēre ere, nābọ̀ ọ́bọ̀ n'aru ndi nāmataghi Chineke, ha na ndi nāṅaghi nti ozi ọma nke Onye-nwe-ayi Jisus: 9 bú madu ndi gāhu ahuhu-nmehie nke ọmuma-ikpe ziri ezi, bú nbibi ebighi-ebi nke sitere n'iru Onye-nwe-ayi, site kwa n'ebube nke ike-Ya, 10 mb͕e ọ bula Ọ gabia ka ewe nye Ya otuto nime ndi nsọ Ya, ka ibobo-Ya we nwu kwa ihe nile n'aru nime ndi kwereri ekwe (n'ihi na ekwere àmà ayi b͕ara unu) n'ubọchi ahu. 11 Ọ bu kwa nka ka ayi ji nēkpe kwa ekpere bayere unu mb͕e nile, ka Chineke-ayi we gua unu na ndi kwesiri ọkpukpọ akpọrọ unu, ka O were kwa ike mezu ihe nile ọ bula nke diri idi-nma ezi nma na ọlu nile ọ bula nke okwukwe; 12 ka ewe nye aha Onye-nwe-ayi Jisus otuto nime unu, nye kwa unu onwe-unu otuto nime Ya, dika amara nke Chineke-ayi na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist si di.

2 Tesalọnaika 2

1 Ma ayi nāriọ unu, umu-nna-ayi, n'ihi ọbibia nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na nzukọ ayi gēzukọ n'ebe Ọ nọ; 2 ka ewe ghara isite n'aka mọ, ma-ọbu okwu, ma ọbu akwukwọ-ozi di ka o sitere n'aka-ayi, me ka unu me nkpatu pua n'uche-unu ọsọsọ, ma-ọbu ka unu tua ujọ, dika agāsi na ubọchi Onye-nwe-ayi di ub͕u a: 3 unu ekwela ka onye ọ bula ghọb͕ue unu n'uzọ ọ bula: n'ihi na ọ gaghi-adi, ma ọ buru na nwezuga ahu ebughi uzọ bia, ewe kpughe onye ahu nēmebi iwu, bú nwa nke ila-n'iyì, 4 onye nēmegide nēweli kwa onwe-ya elu imegide ihe nile anākpọ Chineke ma-ọbu nke bu ihe anāsọpuru dika Chineke; ya mere ọ nānọdu n'ulo nsọ nke Chineke, nēgosi onwe-ya si na ya bu Chineke. 5 Ùnu echetaghi, na, mb͕e m'nānọ n'etiti unu n'oge gara aga, ọ bu ihe ndia ka m'nāgwa unu? 6 Ub͕u a unu matakwara ihe nēb͕ochi, ka ewe kpughe ya n'oge nke aka ya. 7 N'ihi na ihe-omimi nke nmebi-iwu nālusi ọlu ike ub͕u a: nání rue mb͕e agēwepu onye ahu n'etiti, bú onye nēb͕ochi ub͕u a. 8 Mb͕e ahu ka agēkpughe kwa onye ahu nēmebi iwu, onye Onye-nwe-ayi Jisus gēwere iku-ume nke si n'ọnu-Ya puta b͕ue, were kwa ngosi nke ọbibia-Ya me ka ọ ghara idi irè; 9 bú onye ahu, nke ọbibia-ya di ka ilusi-ọlu-ike nke Setan n'ike nile ọ bula na ihe-iriba-ama di iche iche na ọlu-ebube di iche iche nke ugha, 10 n'aghughọ nile kwa nke ajọ omume n'ebe ndi nāla n'iyì nọ; n'ihi na ha anaraghi ihu-n'anya nke ezi-okwu nke-ọma, ka ewe zọputa ha. 11 N'ihi nka Chineke nēzitekwara ha ilusi-ọlu-ike nke njehie, ka ha kwere ugha ahu: 12 ka ewe kpe ha nile ikpé, bú ndi nēkweghi ezi-okwu, kama ajọ omume diri ha ezi nma. 13 Ma ayi onwe-ayi ji ugwọ ikele Chineke ekele mb͕e nile bayere unu, umu-nna-ayi ndi Onye-nwe-ayi huru n'anya, n'ihi na Chineke rọputara unu site na mbu ka unu we nwe nzọputa nime ido-nsọ nke Mọ Nsọ nēdo na ikwere ezi-okwu: 14 nke O sitere n'aka ozi ọma ayi kpọbata unu nime ya, ka unu we nweta ebube nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist. 15 Ya mere otú a, umu-nna-ayi, nēguzosinu ike, jidekwanu ozizí nile enyere n'aka idebe nke ezíri unu, ma-ọbu site n'okwu-ọnu-ayi, ma-ọbu site n'akwukwọ-ozi-ayi. 16 Ma ka Ya onwe-ya, bú Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na Chineke, bú Nna-ayi, Onye huru ayi n'anya nye kwa ayi nkasi-obi ebighi-ebi na ezi olile-anya nime amara, 17 ka Ọ kasie obi-unu, me kwa ka ha guzosie ike n'ezi ọlu na ezi okwu nile ọ bula.

2 Tesalọnaika 3

1 Nke fọduru, umu-nna-ayi, nēkpenu ekpere bayere ayi, ka okwu Onye-nwe-ayi we b͕a ọsọ, ka ewe nye kwa ya otuto, otú ọ di kwa n'etiti unu; 2 ka ewe dọputa kwa ayi n'aka ajọ madu ndi nēmehie kwa; n'ihi na ọ bughi madu nile nwere okwukwe. 3 Ma Onye-nwe-ayi bu onye kwesiri ntukwasi-obi, Onye gēme ka unu guzosie ike, che kwa unu ka unu ghara idabà n'aka ajọ onye ahu. 4 Ma ayi atukwasiwo obi n'aru unu nime Onye-nwe-ayi, na unu nēme, gēme kwa, ihe nile ayi nēme n'iwu. 5 Ma Onye-nwe-ayi duzie obi-unu bà n'ihunanya nke Chineke, bà kwa na ntachi-obi nke Kraist-ayi. 6 Ma ayi nēnye unu iwu, umu-nna-ayi, n'aha nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ka unu nēze nwa-nna ọ bula nādighi-agazi ije, ọ dighi-eje kwa dika ozizí ahu enyere n'aka-ha idebe nke ha natara n'aka-ayi. 7 N'ihi na unu onwe-unu matara otú unu nāghaghi iṅomi ayi: n'ihi na ayi abughi ndi nādighi-agazi ije n'etiti unu; 8 ayi erighi kwa nri n'aka onye ọ bula n'efu, kama n'idọb͕u onye-ayi n'ọlu na ihuju-anya, nālu ọlu abali na ehihie, ka ayi we ghara ibob͕u onye ọ bula nime unu: 9 ọ bughi na ayi enweghi ike, ma ọ bu ka ayi we were onwe-ayi mere unu ihe-atù, ka unu we ṅomi ayi. 10 N'ihi na mb͕e ayi nọ n'etiti unu, ọ bu kwa nka ka ayi nēnye unu n'iwu, si, Ọ buru na onye ọ bula achọghi ilu ọlu, ya ghara kwa iri ihe. 11 N'ihi na ayi nuru okwu bayere ufọdu ndi nādighi-alu ọlu ọ bula, kama ha nētiye aka n'ọlu nke nābughi nke aka ha. 12 Ma ndi di otú a ka ayi nēnye iwu nāriọ kwa aririọ nime Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ka ha were nwayọ nālu ọlu, ri kwa nri nke aka ha. 13 Ma unu onwe-unu, umu-nna-ayi, ike agwula unu n'obi n'ime ihe ọma. 14 Ma ọ buru na onye ọ bula aṅaghi nti okwu ayi ji akwukwọ-ozi a kwu, ribanu onye ahu ama, ka unu ghara iso ya mekọ ihe, ka ewe me ya ihe-ihere n'iru. 15 Unu agukwala ya n'onye-iro, kama nādunu ya ọdú dika nwa-nna. 16 Ma Ya onwe-ya, bú Onye-nwe udo, Ya nye unu udo mb͕e nile n'uzọ nile. Ka Onye-nwe-ayi nọyere unu. 17 Ekele nke mu Pọl nke m'ji aka nkem de, nke bu ihe-iriba-ama n'akwukwọ-ozi nile ọ bula: otú a ka m'nēde. 18 Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist dinyere unu nile.

1 Timọti 1

1 Pọl, onye-ozi nke Kraist Jisus dika ihe ahu si di, nke Chineke, bú Onye-nzọputa-ayi, na Kraist Jisus, bú Onye ayi nēle anya Ya, nyere n'iwu; 2 anamedegara Timọti akwukwọ, bú ezi nwam n'okwukwe: Amara na ebere na udo diri gi nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Kraist Jisus Onye-nwe-ayi puta. 3 Dika m'riọrọ gi ka i nọgide n'Efesọs, mb͕e m'gaje iga nime Masedọnia, ka i we nye madu ufọdu iwu ka ha ghara izí ihe di iche, 4 ka ha ghara kwa iṅa nti akukọ-ifò di iche iche na akukọ osuso-ọmumu di iche iche nādighi-agwu agwu, nke bu ihe nākpata ajuju, kari ikpata ọchichi-èzí-na-ulo nke Chineke nke di nime okwukwe: otú a ka m'nēme ub͕u a. 5 Ma ihe ezubere iweta n'iwu ahu bu ihu-n'anya sitere n'obi ọcha na ezi akọ-na-uche na okwukwe nke iru-abua nādighi ya: 6 nke madu ufọdu, ebe ha hiere ha, ha siri nime ha jehie we kwue okwu efu; 7 chọ kwa ibu ndi-ozizí nke iwu, ọ bu ezie na ha aghọtaghi ihe ha nēkwu, ha aghọtaghi kwa ihe ahu ha nēkwusi ike bayere ha. 8 Ma ayi matara na iwu ahu di nma, ma ọ buru na onye ọ bula ewere ya me ihe n'uzọ kwesiri iwu, 9 ebe ọ matara nka, na adighi-enye onye ezi omume iwu, kama anēnye ndi nēmebi iwu, ndi nēkweghi kwa idi n'okpuru iwu, nye ndi nāsọpurughi Chineke, ndi bu kwa ndi-nmehie, nye ndi nādighi ọcha n'obi, ndi emeru-kwa-ra emeru, nye ndi nēb͕u nna-ha na ndi nēb͕u nne-ha, nye ndi nēb͕u madu, 10 nye ndi nākwa iko, nye ndikom nēmeru onwe-ha n'aru ndikom, nye ndi nēzu madu n'ori, nye ndi-ugha, nye ndi nāṅu iyi ugha, ma ọ buru kwa na ihe ọ bula ọzọ di iche di nēmegide ozizí ahu nke nēnye ezi ndu; 11 dika ozi ọma nke ebube nke Chineke di ngọzi si di, nke enyere mu onwem n'aka na ntukwasi-obi idebe. 12 Anamekele Onye ahu Nke merem ka m'di ike, bú Kraist Jisus Onye-nwe-ayi, n'ihi na Ọ gurum n'onye kwesiri ntukwasi-obi, ebe O deberem ijere Ya ozi; 13 ọ bu ezie na abum onye nēkwulu Chineke na mbu, buru kwa onye-nsob͕u, na onye nēme madu ihe-ihere: otú ọ di, O merem ebere, n'ihi na emerem ya nāmaghi ama nime ekweghi-ekwe; 14 ma amara nke Onye-nwe-ayi, ya na okwukwe na ihu-n'anya nke di nime Kraist Jisus, riri nne nke-uku. 15 Okwu a kwesiri ntukwasi-obi, kwesi kwa ka anara ya nke-ọma n'uzọ nile ọ bula, na Kraist Jisus biara n'uwa izọputa ndi-nmehie; ndi mu onwem bu onye-isi-ha: 16 otú ọ di, ọ bu n'ihi nka ka emerem ebere, ka o we buru nime mu onwem, bú onye-isi, ka Jisus Kraist gēgosi ogologo-ntachi-obi-Ya nile, ka m'buru ihe ilere anya n'etiti ndi gaje ikwere na Ya ka ha nata ndu ebighi-ebi. 17 Ma Eze nke mb͕e nile, Nke anāpughi imebi emebi, Nke anāpughi ihu anya, Onye nání Ya bu Chineke, nsọpuru na otuto diri Ya rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen. 18 Iwu a ka m'nēnye n'aka-gi idebe, nwam Timọti, dika amuma nile si di nke eburu uzọ bu bayere gi, ka i we were ha bu agha ọma nka; 19 nēnwe okwukwe na ezi akọ-na-uche; nke ufọdu nupuru n'ebe ha nọ, ub͕ọ-ha we kpùe n'ebe okwukwe-ayi di: 20 ndi Haimeniọs na Aleksanda nọ n'etiti ha; ndi m'rara nye n'aka Setan, ka ewe site n'ahuhu zí ha ka ha ghara ikwulu Chineke.

1 Timọti 2

1 Ya mere ihe mbu m'nādusi ọdu ike bu, ka anāriọ aririọ, kpe kwa ekpere, riọ kwa aririọ anāriọrọ ndi ọzọ, kele kwa ekele, n'ihi madu nile; 2 n'ihi ndi-eze na ndi nile nọ n'ọnọdu di elu; ka ayi we biri obi udo na nke di nwayọ nime nsọpuru-Chineke nile na ikwesi-nsọpuru nile. 3 Nka di nma buru kwa ihe agānara nke-ọma n'iru Onye-nzọputa-ayi, bú Chineke; 4 Onye nāchọ ka azọputa madu nile, ka ha biaru kwa nmazu nke ezi-okwu. 5 N'ihi na otù Chineke di, otù Onye-ob͕ub͕o di kwa n'ab͕ata Chineke na madu, Onye Ya onwe-ya bu madu, bú Kraist Jisus, 6 Onye nyere Onwe-ya ka Ọ buru ihe-nb͕aputa n'ihi madu nile; nke agāb͕a àmà-ya n'oge nke aka ya; 7 nke edebere mu onwem ka m'buru onye-nkwusa na onye-ozi ka m'we b͕a àmà ahu (anamekwu ezi-okwu, ekwughm okwu-ugha), ibu kwa onye-ozizí nke ndi mba ọzọ nime okwukwe na ezi-okwu. 8 Ya mere ezuberem ka ndikom nēkpe ekpere n'ebe nile ọ bula, nāchili aka di ọcha elu, nēweghi iwe, nārughi kwa uka. 9 Otú ahu, ezuberem ka ndinyom were ihe-ichọ-nma kwesiri ekwesi chọ onwe-ha nma, ya na nsọpuru na uche zuru okè; ọ bughi isi akpara akpa, na ọla-edo ma-ọbu pearl ma-ọbu uwe di oké ọnu-ahia; 10 kama (nke kwesiri ndinyom nēkwuputa egwu Chineke) ka ha site n'ezi ọlu chọ onwe-ha nma. 11 Ka nwanyi were nwayọ muta n'ido onwe-ya n'okpuru n'uzọ nile. 12 Ma ekweghm nwanyi ka o zí ihe, ma-ọbu ka ọ buru onye-isi n'ebe nwoke nọ, kama ka ọ nọ n'ọnọdu nwayọ. 13 N'ihi na Adam ka eburu uzọ kpu, mb͕e ahu ewe kpu Iv; 14 ọ bughi kwa Adam ka aghọrọ aghughọ, ma ebe aghọb͕uru nwanyi ọ bu nwanyi ahu ka ahuworo na ọ nọ nime njehie: 15 ma agēsite n'ọmumu-nwa-ya zọputa ya, ma ọ buru na ha anọgide nime okwukwe na ihu-n'anya na odido-nsọ, ya na uche zuru okè.

1 Timọti 3

1 Okwu a kwesiri ntukwasi-obi, Ọ buru na onye ọ bula nāb͕aso ọnọdu onye nēlekọta nzukọ Kraist anya, agu ọlu ọma nāgu ya. 2 Ya mere onye nēlekọta nzukọ Kraist anya aghaghi ibu onye anādighi-akalu, di nke otù nwunye, onye-anya-udo, onye uche-ya zuru okè, onye omume-ya kwesiri ekwesi, onye nēle ndi-ọbìa anya nke-ọma, onye nwere ike izí ihe; 3 onye nādighi-ese okwu site n'iṅubiga manya ókè, onye nādighi-eti madu aka; kama onye nwere obi-ọma, onye nādighi-alu ọ̀gù, onye nādighi-ahu ego n'anya; 4 onye nāchi èzí-na-ulo nke aka ya nke-ọma, nēnwe kwa umu-ya n'okpuru ya n'ikwesi-nsọpuru nile; 5 (ma ọ buru na onye ọ bula amataghi otú ọ gāchi èzí-na-ulo nke aka ya, ò gēsi aṅa le nzukọ Chineke anya nke-ọma? ) 6 onye nābughi onye ọhu, ka aghara ifuli ya elu, o we dabà n'ọmuma-ikpé ekwensu. 7 Ma ọ ghaghi kwa inwe àmà di nma site n'ọnu ndi nọ n'èzí; ka ọ ghara idabà n'ita-uta, ya na ima n'ọnyà ekwensu. 8 Otú ahu ndi nējere nzukọ Kraist ozi aghaghi ibu ndi kwesiri nsọpuru, ndi nēnweghi ire abua, ndi nādighi-aṅubiga manya ókè, ndi akpiri urù nke nēweta ihere nādighi-akpọ ha nku; 9 ndi nēnwe ihe-omimi nke okwukwe-ayi nime akọ-na-uche di ọcha. 10 Ma ka eburu uzọ nwa kwa ndia; mb͕e ahu ka ha jebe ozi, ma ọ buru na ha bu ndi anāpughi ibo ebubo. 11 Otú ahu ndinyom aghaghi ibu ndi kwesiri nsọpuru, ndi nādighi-ebo madu ebubo ugha, ndi nwere anya-udo, ndi kwesiri ntukwasi-obi n'ihe nile. 12 Ka ndi nējere nzukọ Kraist ozi buru di nke otù nwanyi, nāchi umu-ha na èzí-na-ulo nke aka ha nke-ọma. 13 N'ihi na ndi jeworo ozi nke-ọma nēnwetara onwe-ha ọnọdu ọma, na oké nkwuwa-okwu nime okwukwe nke ekwere na Kraist Jisus. 14 Ihe ndia ka m'nēdegara gi n'akwukwọ, ọ bu ezie na anamele anya ibiakute gi na mb͕e ntà; 15 ma ọ buru na m'nānọ ọdù, ka i we mata otú anāghaghi ibi obi n'èzí-na-ulo Chineke, ebe ọ bu nzukọ nke Chineke di ndu, bú ide na ntọ-ala nke ezi-okwu. 16 Ọ bu kwa ihe anēkwuputa na ọ di uku, bú ihe-omimi nke nsọpuru-Chineke; Onye ahu Nke emere ka Ọ puta ìhè n'anu-aru, Nke aguru Ya n'onye ezi omume nime mọ, Nke emere ka ndi-mọ-ozi hu Ya anya, Nke ekwusara Ya n'etiti ndi mba ọzọ, Nke ekwere na Ya nime uwa, Nke anara Ya n'elu nime ebube.

1 Timọti 4

1 Ma Mọ Nsọ nēkwuwa okwu, si, na n'oge ikpe-azu ufọdu gēwezuga onwe-ha n'ebe okwukwe-ayi di, nāṅa nti ndi-mọ nēduhie eduhie na ozizí nke ndi-mọ ọjọ, 2 site n'iru-abua nke ndi nēkwu okwu-ugha, ndi eji ígwè ọku da ha n'akọ-na-uche nke aka ha; 3 ndi nēb͕ochi madu ilu di na nwunye, ndi si kwa madu erila ihe-oriri di iche iche, nke Chineke kère ka ndi kwere ekwe, ndi mazu-kwa-ra ezi-okwu, ka ndi ahu were ekele nara. 4 N'ihi na ihe nile ọ bula Chineke kère di nna, ọ dighi kwa ihe ọ bula agāju, ma ọ buru na ewere ekele nara ya: 5 n'ihi na esitere n'okwu Chineke na ekpere do ya nsọ. 6 Ọ buru na i me ka umu-nna-ayi nēchè uche n'ihe ndia, i gābu onye nējere Kraist Jisus ozi nke-ọma, ebe anāzùputa gi n'okwu nile nke okwukwe-ayi, na nke ozizí ọma ahu nke i soworo n'ukwu n'ukwu: 7 ma ju akukọ-irò nile emeruru emeru nke di-kwa-ra agadi-ndinyom. Ma nānwa onwe-gi ka i we rue nsọpuru-Chineke: 8 n'ihi na ọnwunwa nke aru bara urù nye ihe ntà; ma nsọpuru-Chineke bara urù nye ihe nile, ebe o nwere nkwa nke ndu, ma nke ndu ub͕u a, ma nke gaje ibia. 9 Okwu a kwesiri ntukwasi-obi, kwesi kwa ka anara ya nke-ọma n'uzọ nile ọ bula. 10 N'ihi na ọ bu iru nka ka ayi nādọb͕u onwe-ayi n'ọlu, nāb͕asi kwa nb͕a ike, n'ihi na ayi elewo anya Chineke di ndu, Onye bu Onye-nzọputa madu nile, ma nke kachasinu Onye nzọputa nke ndi kwere ekwe. 11 Nēnye ihe ndia n'iwu, nēzí kwa ha. 12 Ekwela ka onye ọ bula lelìa nwata i bu anya; kama me onwe-gi ka i buru ndi kwere ekwe ihe-atù, n'okwu, n'ibi-obi, n'ihu-n'anya, n'okwukwe, n'idi-ọcha. 13 Rue mb͕e m'gābia, nāṅa nti ọgugu-akwukwọ-gi na idu-ọdu-gi na ozizí-gi. 14 Elefula onyinye-amara ahu nke di nime gi anya, nke esitere n'ibu-amuma, ya na ibikwasi-aka-n'isi nke ndi bu okenye, nye gi. 15 Nējisi ike n'ihe ndia; nānọsi ike nime ha; ka iga-n'iru-gi we puta ìhè n'ebe madu nile nọ. 16 Riba onwe-gi na ozizí-gi ama. Nānọgide n'ihe ndia; n'ihi na n'ime nka i gāzọputa onwe-gi zọputa kwa ndi nānu olu-gi.

1 Timọti 5

1 Abarala okenye oké nba, kama nāriọ ya aririọ dika nna; nēmeso kwa umu-okorọbia dika umu-nne: 2 ndinyom, ndi bu okenye, dika ndi bu nne; umu-ab͕ọghọ dika umu-nne-nwanyi, n'idi-ọcha nile. 3 Nāsọpuru ndinyom di-ha nwuru, bú ndi nọ ezie n'ọnọdu ndinyom di-ha nwuru. 4 Ma ọ buru na nwanyi ọ bula di-ya nwuru nwere umu ma-ọbu umu umu, ka ha buru uzọ muta isọpuru Chineke n'aru ndi èzí-na-ulo nke aka ha, na inyeghachi ndi muru ha ihe: n'ihi na nka bu ihe anānara nke-ọma n'iru Chineke. 5 Ma nwanyi nke bu onye di-ya nwuru n'ezie, nke arapu-kwa-ra nání ya, ọ tukwasiwo obi-ya na Chineke, nānọgide kwa n'aririọ-ya na ekpere-ya abali na ehihie. 6 Ma nwanyi nke nādi ndu ọjọ dika ọ nātọ aru-ya utọ, ọ nwuruwo mb͕e ọ nọ na ndu. 7 Nēnye kwa ihe ndia n'iwu, ka ha we buru ndi anādighi-akalu. 8 Ma ọ buru na onye ọ bula ebughi uzọ chère ndi nke aka ya ihe nākpa ha, ma nke kachasi ndi èzí-na-ulo nke aka ya, ọ gọnariwo okwukwe-ayi, jọkari kwa onye nēkweghi ekwe na njọ. 9 Ka aghara ide aha nwanyi ọ bula n'akwukwọ dika nwanyi di-ya nwuru nke akāb͕aghi ọgu arọ atọ, onye buworo nwunye nke otù di, 10 onye anāb͕ara ya ezi àmà n'ọlu ọma; ọ buru na ọ zùputawo umu, ọ buru na o lewo ndi-ọbìa anya nke-ọma, ọ buru na ọ sawo ukwu ndi nsọ, ọ buru na o b͕owo nkpà ndi anākpab͕u, ọ buru na o sosiwo ezi ọlu nile ọ bula ike. 11 Ma ju umu-ab͕ọghọ di-ha nwuru: n'ihi na mb͕e ọ bula ha nupuru isi n'okpuru Kraist-ayi, ha nāchọ ilu di; 12 ewe ma ha ikpé, n'ihi na ha juru okwukwe mbu ha. 13 Ma tukwasi ihe ndia ha nāmuta kwa ibu ndi nādighi-alu ọlu, nēje n'ulo di iche iche; ma ọ bughi nání na ha bu ndi nādighi-alu ọlu, kama ha bu kwa ndi nēkwu okwu nzuzu, buru kwa ndi nētiye aka n'ọlu nābughi nke aka ha, nēkwu okwu nēkwesighi ka ha kwu. 14 Ya mere anamezube ka umu-ab͕ọghọ ndi di-ha nwuru luru di, mu kwa umu, nāchi kwa èzí-na-ulo-ha, ghara kwa inye onye nēmegide ayi ihe o gēji kwutọ: 15 n'ihi na ufọdu ejehiewo uzọ so Setan ub͕u a. 16 Ọ buru na nwanyi ọ bula nke kwere ekwe nwere ndinyom di-ha nwuru, ya b͕o ha nkpà, ka aghara kwa ibob͕u nzukọ Kraist; ka o we b͕o ndi ahu nkpà, bú ndi nọ n'ezie n'ọnọdu ndinyom di-ha nwuru. 17 Ka agua ndi-okenye na ndi kwesiri nsọpuru okpukpu abua, bú ndi nāchi isi nke-ọma, ma nke kachasinu ndi nādọb͕u onwe-ha n'ọlu nime okwu Chineke na ozizí. 18 N'ihi na ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nāsi, Ekechila ọnu ehi mb͕e ọ nāzọcha ọka. Na, Onye-ọlu kwesiri ugwọ-ọlu-ya. 19 Anarala ebubo anēbo okenye, ma-ọbughi n'ọnu ndi-àmà abua ma-ọbu atọ. 20 Nātu ndi nēmehie nmehie-ha n'anya n'iru madu nile, ka ndi fọduru we tu kwa egwu. 21 Anamagwasi gi ike n'iru Chineke, na n'iru Kraist Jisus, na n'iru ndi-mọ-ozi arọputara, ka i debe iwu ndia, ghara ima ikpé mb͕e i kānughi, ghara kwa ime ihe ọ bula n'uzọ isọ-anya. 22 Ebikwasila onye ọ bula aka n'isi ọsọsọ, eso-kwa-la ndi ọzọ nwekọ nmehie-ha: debe onwe-gi ọcha. 23 Abu-kwa-la onye nāṅu nání miri ọzọ, kama nāṅu nwantinti manya-vine n'ihi afọ-gi na nriaria nke nāria gi ọtutu mb͕e. 24 Nmehie madu ufọdu nāputa ìhè, n'ihi na ha buru ha uzọ nāga ikpé; ma nmehie madu ufọdu nēso kwa ha n'azu. 25 Otú ahu, ọlu nile nke di nma nāputa kwa ìhè; apughi kwa izobe ọlu nke di iche.

1 Timọti 6

1 Ka ha ra, bú ndi-orù nke nọ n'okpuru yoke, ha gua ndi-nwe-ha na ndi kwesiri nsọpuru nile, ka ewe ghara ikwulu aha Chineke na ozizí-ayi. 2 Ma ndi nwere ndi kwere ekwe dika ndi-nwe-ha, ka ha ghara ilelì ha anya, n'ihi na ha bu umu-nna-ha; kama ka ha buru orù-ha kari, n'ihi na ndi soro ha ke òkè n'ọlu ọma ha bu ndi kwere ekwe na ndi ahuru n'anya. Nēzí ihe ndia nādu kwa madu ọdú bayere ha. 3 Ọ buru na onye ọ bula nēzí ihe di iche, nēkweyeghi kwa n'okwu nēnye ezi ndu, bú okwu nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na ozizí ahu nke di ka nsọpuru-Chineke si di; 4 afuliwo ya elu, ọ dighi ihe ọ mara, kama ọria bayere ajuju na esem-okwu n'ihi okwu efu nāria ya, nke ekworo, esem-okwu, nkwulu, ajọ èchìchè, nēsi nime ha nāputa, 5 bú iru-uka nke madu ndi mebiworo n'uche, ndi apunarawo-kwa-ra ha ezi-okwu, ebe ha nāgu na nsọpuru-Chineke bu uzọ irita urù. 6 Ma nsọpuru-Chineke, ya na inwezu ihe nile di nkpà, bu uzọ irita urù nke-uku; 7 n'ihi na ayi ewetaghi ihe ọ bula n'uwa, ọ bu kwa n'ihi na ayi apughi iwere ihe ọ bula pua nime ya; 8 ma ebe ayi nwere ihe-oriri na ihe ib͕okwasi n'aru, afọ gēju ayi n'ihe ndia. 9 Ma ndi nēzube ibu ọgaranya nādabà n'ọnwunwa na ọnyà na ọtutu agu ihe ọjọ nke uche nādighi nime ha, nke nēmeru kwa aru, bú ihe nēme ka madu mikpù emikpù nime nbibi na ila-n'iyì. 10 N'ihi na ihu ego n'anya bu nkpọrọgwu nke ihe ọjọ nile di iche iche: nke ufọdu nāb͕asosi ike, ewe duhie ha n'okwukwe-ayi, ha were kwa ọtutu ihe-nb͕u dupue onwe-ha. 11 Ma gi onwe-gi, onye nke Chineke, nāb͕anari ihe ndia; ma nāb͕aso ezi omume, nsọpuru-Chineke, okwukwe, ihu-n'anya, ntachi-obi, idi-nwayọ. 12 Nāb͕asi nb͕a ọma nke okwukwe ike, jide ndu ebighi-ebi aka nke akpọrọ gi ka i nata ya, i kwuputa-kwa-ra nkwuputa ọma ahu n'iru ọtutu ndi-àmà. 13 Anamenye gi iwu n'iru Chineke, Onye nēme ka ihe nile di ndu, ya na n'iru Kraist Jisus, Onye b͕ara àmà nkwuputa ọma ahu n'iru Pọntiọs Pailat; 14 ka gi onwe-gi debe ihe ahu enyere n'iwu, nēnweghi ntupọ, onye anādighi-akalu akalu, rue ngosi nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist: 15 nke Ọ gēgosi n'oge nke aka Ya, Onye nání Ya bu Onye di ike, Onye bu kwa onye di ngọzi, bú Eze kachasi ndi bu eze, Onye bu kwa Onye-nwenu kachasi ndi nāchi ka ndi-nwe madu; 16 Onye nání Ya nwere anwughi-anwu, nēbi nime ìhè nke anāpughi ibiaru nso; Onye ọ dighi madu ọ bula huworo Ya anya, ma-ọbu pu ihu Ya anya: Onye nsọpuru na ike ebighi-ebi diri. Amen. 17 Nēnye ndi bu ọgaranya n'oge di ub͕u a iwu, ka ha ghara itukwasi uche-ha n'ihe di elu, ghara kwa itukwasi obi n'ihe ahu anējighi aka, bú àkù, kama ka ha tukwasi obi na Chineke, Onye nēwere àkù-Ya nye ayi ihe nile ka ha buru ihe gātọ ayi utọ; 18 ka ha nēme ezi ihe, ka ha buru ọgaranya n'ọlu ọma nile, ka ha buru ndi kwadebeworo ime ka ndi ọzọ keta ihe ha nwere, ka ha buru ndi kwere ka ndi ọzọ so ha nwekọ ihe; 19 ka ha kpadoro onwe-ha ntọ-ala ọma nye oge gaje ibia, ka ha we jide ndu ahu nke bu ndu n'ezie. 20 Biko Timọti, nēche ihe ahu enyere gi n'aka idebe, nēze okwu efu nile nke emeruru emeru nke ihe ahu anākpọ ihe-ọmuma n'uzọ ugha, ha na nguzogide-ya nile; 21 bú ihe-ọmuma nke ufọdu kwuputara we hie n'ihe bayere okwukwe-ayi. Ka amara diyere unu.

2 Timọti 1

1 Pọl, onye-ozi nke Kraist Jisus site n'ọchichọ nke Chineke, dika nkwa nke ndu ahu nke di nime Kraist Jisus si di, 2 nēdegara Timọti akwukwọ, bú nwam nke m'huru n'anya: Amara na ebere na udo diri gi, nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Kraist Jisus Onye-nwe-ayi puta. 3 Anameleke Chineke, Onye m'nēkpere site na nnam ochie-hà n'akọ-na-uche di ọcha, otú nchetam bayere gi n'aririọm nile di n'ewepughi aka, 4 n'ihi na agu ihu gi nāgusim ike abali na ehihie, ebe m'nēcheta anya-miri-gi nile, ka m'we juputa n'ọṅù; 5 ebe emerem ka m'cheta okwukwe iru-abua nādighi ya nke di nime gi; bú okwukwe nke buru uzọ biri nime nne-gi ochie Lois na nne-gi Yunaisi; ma emerem ka m'kweye na o bi kwa nime gi. 6 Ọ bu kwa n'ihi ihe a ka m'nēchetara gi ka i me ka onyinye-amara nke Chineke nwuru ọku, bú nke di nime gi site n'ibikwasi aka abua nkem n'isi-gi. 7 N'ihi na Chineke enyeghi ayi mọ nke ujọ; kama ọ bu nke ike na ihunanya na ime ka uche zuo okè. 8 Ya mere ka ihere àmà nke Onye-nwe-ayi, ma-ọbu ihere nke mu onye-nkpọrọ-Ya, ghara ime gi: kama so ozi ọma Ya hujukọ anya dika ike nke Chineke si di; 9 Onye zọputara ayi, were kwa ọkpukpọ di nsọ kpọ ayi, ọ bughi dika ọlu-ayi si di, kama dika ihe Ya onwe-ya zubere, na amara-Ya, si di, nke enyere ayi nime Kraist Jisus mb͕e oge ebighi-ebi akērughi, 10 ma emere ka ọ puta ìhè ub͕u a site na ngosi nke Onye-nzọputa-ayi Kraist Jisus, Onye mere ka ọnwu ghara idi ìrè, site kwa n'ozi ọma Ya weputa ndu na emebighi-emebi n'ìhè, 11 bú ozi ọma nke edoro mu onwem ka m'buru onye-nkwusa, na onye-ozi, na onye-ozizí, izisa ya. 12 Ọ bu kwa n'ihi ihe a ka m'nāhu kwa ahuhu ndia: ma ihere adighi-emem; n'ihi na amataram Onye m'kweworo okwu-Ya, eme-kwa-ra ka m'kweye na Ọ puru iche ihe m'nyere n'aka-Ya idebe nche rue ubọchi ahu. 13 Jide ihe ilere anya nke okwu nēnye ezi ndu nke i nuru n'ọnum, nime okwukwe na ihunanya nke di nime Kraist Jisus. 14 Ihe ọma ahu nke enyere n'aka-gi idebe, were Mọ Nsọ Nke bi nime ayi nēche ya. 15 I matara nka, na ndi nile di n'Esia b͕akutaram azu; ndi Faigelọs na Hamọgenis di n'etiti ha. 16 Ka Onye-nwe-ayi mere èzí-na-ulo Ọnisifọrọs ebere: n'ihi na o mere ka m'nwe ume ndu ọtutu mb͕e, ihere nkpọrọm emeghi kwa ya; 17 kama, mb͕e ọ biaruru Rom, o were inu-ọku-n'obi chọbam, we chọtam 18 (ka Onye-nwe-ayi nye ya ka ọ chọta ebere n'aka Onye-nwe-ayi n'ubọchi ahu); ka ha ra kwa, bú ihe o ji jere m ozi n'Efesọs, gi onwe-gi jere karia.

2 Timọti 2

1 Ya mere, gi onwe-gi, nwam, ka eme ka i di ike n'amara nke di nime Kraist Jisus. 2 Ihe nile i nukwara n'ọnum site n'etiti ọtutu ndi-àmà, nye ihe ndia n'aka madu ndi kwesiri ntukwasi-obi idebe, bú madu ndi ọ gēkwe kwa izí madu-ibe-ha ihe ndia. 3 Som hujukọ anya, dika onye-agha ọma nke Kraist Jisus. 4 Ọ dighi onye-agha ọ bula nātuhi onwe-ya n'ihe nke ibi-obi a mb͕e o nēbu agha; ka o we me ihe gātọ onye dere aha-ya n'akwukwọ dika onye-agha. 5 Ma ọ buru kwa na onye ọ bula nāb͕a nb͕a, ekpughi ya okpu-nmeri, ma ọ buru na ọ b͕aghi nb͕a otú ọ di n'iwu. 6 Onye-ọlu-ubi nke nādọb͕u onwe-ya n'ọlu aghaghi ibu uzọ kère òkè na nkpuru-ya. 7 Nātughari uche n'ihe m'nēkwu; n'ihi na Onye-nwe-ayi gēnye gi nghọta n'ihe nile. 8 Nēcheta Jisus Kraist, dika Onye emeworo ka O si na ndi nwuru anwu bilie, Onye si na nkpuru Devid puta, dika ozi ọmam si di: 9 nke m'nāhuju anya nime ya rue ab͕u, dika onye nālu ọlu ọjọ; ma ekeghi okwu Chineke ab͕u. 10 N'ihi nka ka m'nwere ntachi-obi n'ihe nile n'ihi ndi arọputara, ka ha onwe-ha we ru kwa nzọputa nke di nime Kraist Jisus, ya na ebube ebighi-ebi. 11 Okwu a kwesiri ntukwasi-obi: N'ihi na asi na ayi soro Ya nwukọ ọnwu, ayi gēso kwa Ya dikọ ndu: 12 asi na ayi nēnwe ntachi-obi, ayi gēso kwa Ya bukọ eze: asi na ayi gāgọnari Ya, Ya onwe-ya gāgọnari kwa ayi: 13 asi na ayi ekweghi ekwe, Ya onwe-ya nānọgide n'ikwesi ntukwasi-obi; n'ihi na Ọ pughi igọnari Onwe-ya. 14 Nēchetara ha ihe ndia, nāgwasi ha ike n'iru Onye-nwe-ayi, ka ha ghara ise okwu bayere okwu efu, bú ihe nābaghi n'ihe, nēkpù ndi nānu anu iru. 15 Nānu ọku n'obi iche onwe-gi n'iru madu dika onye Chineke nwaputaworo, onye-ọlu nke ihere nāpughi ime ya, onye nēkwuzi okwu nke ezi-okwu ahu. 16 Ma nēze okwu efu nile emeruru emeru: n'ihi na ha gāga kari n'iru n'asọpurughi-Chineke, 17 okwu-ha gābu kwa ọnyá nāba aba dika gangrene: ndi Haimeniọs na Filitọs di n'etiti ha; 18 bú madu ndi hiere n'ihe bayere ezi-okwu ahu, nāsi na nbilite-n'ọnwu agabigawo ub͕u a, ha nēkpù kwa okwukwe madu ufọdu iru. 19 Otú ọ di, ntọ-ala di ike nke Chineke nēguzo, ebe o nwere akàrà nka, Onye-nwe-ayi mara ndi bu nke Ya: na, Ka onye ọ bula nke nākpọ aha Onye-nwe-ayi si n'ajọ omume wezuga onwe-ya. 20 Ma nime ulo uku ọ bughi nání ihe ọla-edo na ihe ọla-ọcha di, kama ihe osisi na ihe ájá di kwa; e mekwara ufọdu ka ha buru ihe-nsọpuru, me kwa ufọdu ha na buru ihe-ihere. 21 Ya mere ọ buru na onye ọ bula asacha onwe-ya pua n'ihe ndia, ọ gābu ihe emere ka ọ buru ihe-nsọpuru, ihe edoworo nsọ, ihe bara n'ihe ka Onye-nwe-ya were ya me ihe, ihe edoziworo iji lu ezi ọlu nile ọ bula. 22 Ma nāb͕anari agu ihe ọjọ nāgu nwa-okorọbia, nāb͕aso kwa ezi omume, okwukwe, ihu-n'anya, udo, gi na ndi nākpọku Onye-nwe-ayi site n'obi di ọcha. 23 Ma nāju iju-ajuju nzuzu na nke amaghi-ihe, ebe i matara na ha nāmuputa ilu-ọ̀gù. 24 Ma orù nke Onye-nwe-ayi aghaghi ibu onye nādighi-alu ọ̀gù, kama ọ ghaghi idi nwayọ n'ebe madu nile nọ, ọ ghaghi kwa ibu onye nwere ike izí ihe, onye nānagide ihe ọjọ, 25 n'idi-nwayọ nādọ ndi nēdo onwe-ha imegide ya aka na nti; ma asi na ọ bu ezie ma eleghi anya na Chineke gēnye ha nchèghari ka ha we mazu ezi-okwu, 26 we teta n'ura manya pua n'ọnyà ekwensu, ebe orù Onye-nwe-ayi nwudeworo ha na ndu ka ha me ihe Chineke nāchọ.

2 Timọti 3

1 Ma mara nka, na oge di oké egwu gābia na mb͕e ikpe-azu. 2 N'ihi na madu gābu ndi nāhu nání onwe-ha n'anya, ndi nāhu ego n'anya, ndi nānya isi, ndi-npako, ndi-nkwulu, ndi nēkweyeghi ndi muru ha, ndi nēnweghi ekele, ndi nādighi ọcha n'obi, 3 ndi ihe madu-ibe-ha nādighi-atọ utọ, ndi nādighi-ab͕a ndu, ndi nēbo ebubo ugha, ndi nādighi-ejide onwe-ha, ndi di ka anu-ọhia, ndi nādighi-ahu ezi ihe n'anya, 4 ndi nārara madu nye n'aka ndi-iro-ha, ndi-isi-ike, ndi afuliworo elu, ndi nāhu ihe-utọ n'anya kama ihu Chineke n'anya; 5 ndi nēnwe udi nke nsọpuru-Chineke, ma ha agọwo ike-ya: gi b͕akuta kwa ndia azu. 6 N'ihi na ha sitere na ndia, bú ndi nēb͕ebà nime ulo di iche iche, nādọta kwa ndinyom nēnweghi uche n'agha, bú ndi ekpokwasiworo ha nmehie, ndi agu ihe ọjọ di iche iche dufuworo, 7 ndi nāmu ihe mb͕e nile, ma ha apughi ibiaru imazu ezi-okwu mb͕e ọ bula. 8 Ma otù uzọ ahu Janis na Jambris guzogidere Moses, otú a ka ndia nēguzogide kwa ezi-okwu ahu; bú madu ndi mebiworo n'uche, ndi ajuru aju n'ihe bayere okwukwe-ayi. 9 Ma ha agaghi-aga n'iru kari: n'ihi na enweghi-uche-ha gāputasi ìhè nye madu nile, dika enweghi-uche nke ndi ahu putakwara. 10 Ma gi onwe-gi soro ozizím, omumem, ihe m'zubere, okwukwem, ogologo-ntachi-obim, ihu-n'anyam, ntachi-obim, 11 nsob͕um nile, ahuhum nile; aha ihe dakwasirim n'Antiọk, n'Aikọniọm, na Listra; aha nsob͕u m'nagidere: Onye-nwe-ayi dọputa-kwa-ram nime ha nile. 12 E, agēsob͕u kwa ndi nile ndi nāchọ idi ndu n'uzọ isọpuru Chineke nime Kraist Jisus. 13 Ma ajọ madu nile na ndi-aghughọ gānaga n'iru n'ijọkari njọ, nēduhie ndi ọzọ, anēduhie kwa ha. 14 Ma gi onwe-gi, nọgide nime ihe nile i mutara, nke eme-kwa-ra ka i kwere ha, ebe i matara madu ndi i mutara ha n'ọnu-ha; 15 ebe i ma-kwa-ra na i sitere n'oge i di na nwa ọhu mata ihe di nsọ nile edeworo n'akwukwọ nsọ nke puru ime ka i buru onye-amam-ihe inata nzọputa site n'okwukwe nke i kwere na Kraist Jisus. 16 Ihe ọ bula edeworo n'akwukwọ nsọ bu ihe si n'obi Chineke puta, ọ ba-kwa-ra urù iji zí ihe, na iji tu madu nmehie-ha n'anya, na iji me ka uche madu guzozie, na iji zùputa nzùputa nke di n'ezi omume: 17 ka onye nke Chineke we zue okè, onye emeworo ka o zue okè ilu ezi ọlu nile ọ bula.

2 Timọti 4

1 Anamagwasi gi ike n'iru Chineke na Kraist Jisus, Onye gaje ikpe ndi di ndu na ndi nwuru anwu ikpé, ewerekwam ngosi-Ya na ala-eze-Ya si gi; 2 kwusa okwu-Ya; tukwasi uche n'ọlu-gi n'oge kwesiri, ma-ọbu n'oge nēkwesighi; tu madu nmehie-ha n'anya, ba nba, riọ aririọ, n'ogologo-ntachi-obi nile na ozizí nile. 3 N'ihi na oge gādi mb͕e ha agaghi-anagide ozizí ahu nke nēnye ezi ndu; kama, ebe ha nwere nti nākọ ọkọ, ha gēkpokwasi ndi-ozizí nye onwe-ha dika agu ihe ọjọ nke aka ha si di; 4 ha gēchighari kwa nti-ha ka ha ghara inu ezi-okwu, ma ha gējehie ṅa nti akukọ-irò. 5 Ma gi onwe-gi, nēnwe anya-udo n'ihe nile, huju anya, lua ọlu nke onye nēzisa ozi ọma, jezu ozi-gi. 6 N'ihi na anāwusim ub͕u a dika àjà-ihe-ọṅuṅu, oge ulam eruwo kwa. 7 Ab͕asiwom nb͕a ọma ahu, ab͕asiwom ọsọ ahu, edebesiwom okwukwe ahu: 8 nke fọduru bu na edebeworom okpu-eze nke ezi omume ahu, nke Onye-nwe-ayi, bú Onye ezi omume n'ikpe ikpé, gēnyeghachim n'ubọchi ahu: ma ọ bughi nání mu onwem, kama Ọ gēnyeghachi kwa ndi nile huworo ngosi-Ya n'anya. 9 Were inu-ọku-n'obi biakutem ọsọsọ: 10 n'ihi na Dimas rapuru náním, ebe ọ huru oge di ub͕u a n'anya, o we ga Tesalọnaika; Kresens gara Galetia, Taitọs gara Dalmetia. 11 Nání Luk nọyerem. Kuru Mak, duru ya ka o so gi onwe-gi bia: n'ihi na ọ bu onye baram n'ihe ijerem ozi. 12 Ma ezigaram Tikikọs n'Efesọs. 13 Uwe nāchu oyi nke m'rapuru na Troas n'aka Kapọs, weta ya mb͕e i gābia, ya na akwukwọ nile, ma nke kachasinu, weta akwukwọ parchment nile. 14 Aleksanda onye nākpu ọlà merem ọtutu ihe ọjọ: Onye-nwe-ayi gēnyeghachi ya ihe dika ọlu-ya nile si di: 15 gi onwe-gi nēche kwa onye ahu nche; n'ihi na o guzogidere okwu-ayi nke-uku. 16 Na ngọpum mbu ọ dighi onye ọ bula nọ n'akukum, kama madu nile rapuru náním: ka aghara igu ya n'isi-ha. 17 Ma Onye-nwe-ayi guzorom nso, we me ka m'di ike; ka ewe were ọnum kwusazue nkwusa ahu, ka ndi mba ọzọ nile we nu kwa: ewe dọputam n'ọnu ọdum. 18 Onye-nwe-ayi gādọputam n'ajọ ọlu nile ọ bula, Ọ gāzọputakwam ka m'bata n'ala-eze-Ya di n'elu-igwe: Onye otuto diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen. 19 Kele Priska na Akwila, na èzí-na-ulo Ọnisifọrọs. 20 Erastọs nọgidere na Kọrint: ma arapurum Trọfimọs nime Militọs, aru adighi ya ike. 21 Were inu-ọku-n'obi bia tutu mb͕e oyi erue. Yubulọs nēkele gi, ya na Pudins, na Lainọs, na Klọdia, na umu-nna-ayi nile. 22 Ka Onye-nwe-ayi nọyere mọ nke gi. Ka amara dinyere unu.

Taitọs 1

1 Pọl, orù nke Chineke, na onye-ozi nke Jisus Kraist, dika okwukwe ndi Chineke rọputara si di, ya na nmazu nke ezi-okwu ahu nke di n'uzọ nsọpuru-Chineke, 2 n'olile-anya nke ndu ebighi-ebi, nke Chineke, Onye nāpughi ikwu okwu-ugha, kwere nkwa ya tutu mb͕e ebighi-ebi erue; 3 ma O mere ka okwu-Ya puta ìhè n'oge nke aka Ya nime nkwusa, nke enyere n'aka mu onwem na ntukwasi-obi idebe dika ihe nke Onye-nzọputa-ayi Chineke nyere n'iwu si di; 4 Pọl nka nēdegara Taitọs akwukwọ, bú ezi nwa nkem dika okwukwe ayi kwekọrọ si di: Amara na udo diri gi nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Kraist Jisus Onye-nzọputa-ayi puta. 5 N'ihi nka ka m'rapuru gi na Krit, ka i we dozie ihe fọduru, do kwa madu ndi-okenye n'obodo nile ọ bula, dika mu onwem nyere gi iwu; 6 ọ buru na onye ọ bula bu onye anāpughi ibo ebubo, di nke otù nwunye, nēnwe umu kwere ekwe, bú ndi anēboghi ebubo na ha nādi ndu ila-n'iyì, ndi nābughi kwa ndi nēkweghi inọ n'okpuru iwu. 7 N'ihi na onye ahu nke nēlekọta nzukọ Kraist anya aghaghi ibu onye anāpughi ibo ebubo, dika onye nāchi èzí-na-ulo Chineke; onye nābughi onye nwere isi-ike, nābughi onye nēwe iwe ọsọsọ, nābughi onye nēse okwu site n'iṅubiga manya ókè, nābughi onye nēti madu aka, nābughi onye akpiri urù nēweta ihere nākpọ nku; 8 kama ọ ghaghi ibu onye nēle ndi-ọbìa nke-ọma, onye nāhu ezi ihe n'anya, onye uche-ya zuru okè, onye ezi omume, onye di ọcha n'obi, onye nējidesi onwe-ya ike; 9 nējide okwu ahu nke kwesiri ntukwasi-obi nke di ka ozizí-ayi si di, ka o we pu idusi ọdu ike nime ozizí nke nēnye ezi ndu, na itu kwa ndi nēkwugide ekwugide nmehie-ha n'anya. 10 N'ihi na ọtutu madu di ndi nēkweghi idi n'okpuru iwu, ndi nēkwu okwu efu, ndi nāghọb͕u kwa obi madu, ma nke kachasinu ndi si n'etiti ndi obibì-úgwù puta, 11 ndi anāghaghi imechi ọnu-ha; ha bu madu ndi nēkpù madu dum di n'èzí-na-ulo iru, nēzí ihe nke nēkwesighi ka ha zí, n'ihi urù nēweta ihere. 12 Otù onye n'etiti ha, bú onye-amuma nke aka ha, siri, Ndi Krit bu ndi-ugha mb͕e dum, anu-ọhia jọrọ njọ, ndi afọ-nri nādighi-alu ọlu. 13 Àmà nka bu ezi-okwu. N'ihi ihe a were kwa aka ike tu ha nmehie-ha n'anya, ka ha we nwe ezi ndu nime okwukwe-ayi, 14 ka ha ghara iṅa nti akukọ-irò ihe di iche nke ndi-Ju, na ihe di iche iche nke madu nyere n'iwu, bú ndi nēchighari rapu ezi-okwu ahu. 15 Ihe nile di ọcha n'ebe ndi di ọcha nọ: ma n'ebe ndi emeruworo ndi nēkweghi kwa ekwe nọ ọ dighi ihe ọ bula di ọcha; kama, emeruwo ma uche-ha ma akọ-na-uche-ha. 16 Ha nēkwuputa na ha matara Chineke; ma ọlu nile ha ka ha ji gọnari Ya, ebe ha bu ihe-ùrú, ndi nādighi-ekwenye kwa, buru kwa ndi ajuru aju n'ebe ezi ọlu nile ọ bula di.

Taitọs 2

1 Ma gi onwe-gi, nēkwu ihe nile kwesiri ozizí ahu nke nēnye ezi ndu: 2 si ka agadi-ndikom nwe anya-udo, kwesiri nsọpuru, nwe uche zuru okè, nwe ezi ndu nime okwukwe-ayi, nime ihu-n'anya, nime ntachi-obi: 3 otú ahu ka agadi-ndinyom di nsọ n'omume-ha, ghara ibu ndi nēbo ebubo ugha, ghara kwa ibu orù nke iṅubiga manya ókè, ka ha buru ndi nēzí ihe ọma; 4 ka ha we me ka ndi bu umu-ab͕ọghọ nwe uche zuru okè ibu ndi nāhu di-ha n'anya, ndi nāhu umu-ha n'anya, 5 ndi uche-ha zuru okè, ndi di ọcha, ndi nālu ọlu n'ulo, ezi madu, ndi nēdo onwe-ha n'okpuru di nke aka ha, ka ewe ghara ikwulu okwu Chineke: 6 otú ahu nāriọ umu-okorọbia ka ha nwe uche zuru okè: 7 n'ihe nile nēme onwe-gi ihe-atù nke ọlu ọma; nime ozizí-gi nēgosi emebighi-emebi, ikwesi-nsọpuru, 8 okwu nke nēnye ezi ndu, nke anāpughi ima ikpe; ka ewe me onye nọ n'akuku ndi nēmegide emegide ihe-ihere n'iru, ebe ọ nēnweghi ihe nādighi nma ikwu bayere ayi. 9 Nāriọ ndi-orù ka ha nēdo onwe-ha n'okpuru ndi-nwe-ha, ka ha buru ndi nēme ihe gātọ ha ezi utọ n'ihe nile; ghara ikwu okwu imegide ha; 10 ghara itutu aka, kama ka ha nēgosi ezib͕o ikwesi-ntukwasi-obi nile; ka ha we chọ ozizí nke Onye-nzọputa-ayi Chineke nma n'ihe nile. 11 N'ihi na egosiri amara nke Chineke, nēwetara madu nile nzọputa, 12 nādọ ayi aka na nti ka ayi we ju asọpurughi-Chineke na agu ihe ọjọ di n'uwa, we di ndu uche zuru okè na nke ezi omume na nke isọpuru-Chineke n'oge di ub͕u a; 13 nēche olile-anya ahu di ngọzi na ngosi nke ebube nke Chineke uku ahu, Nke bu kwa Onye-nzọputa-ayi, Jisus Kraist; 14 Onye nyere Onwe-ya n'ihi ayi, ka O we b͕aputa ayi n'imebi-iwu nile, sachakwara Onwe-ya otù ndi nke gābu ndi nke aka Ya, ndi obi-ha nānuru ọlu ọma ọku. 15 Nēkwu ihe ndia, were kwa ha nādusi ọdu ike, were kwa ha nātu madu nmehie-ha n'anya, n'inye iwu nile. Ka madu ọ bula ghara ilelì gi anya.

Taitọs 3

1 Nēchetara ha ka ha nēdo onwe-ha n'okpuru ndi-isi, n'okpuru ndi nwere ike, ka ha nēkwenye ekweye, ka ha buru ndi edoziworo ilu ezi ọlu nile ọ bula, 2 ka ha ghara ikwulu onye ọ bula, ghara ibu ndi nālu ọ̀gù, ka ha nwe obi-ọma, nēgosi idi-nwayọ nile n'ebe madu nile nọ. 3 N'ihi na ayi onwe-ayi buru kwa ndi nēnweghi uche n'oge gara aga, ndi nēkweyeghi, ndi anēduhie, ndi bu orù agu ihe ọjọ na ihe-utọ di iche iche, nēbi n'obi ọjọ na ekworo, ndi-ùrú, nākpọrita ibe-ayi asì. 4 Ma mb͕e egosiri obi-ọma nke Onye-nzọputa-ayi Chineke, ya na ihu-n'anya-Ya n'ebe madu nọ, 5 O siteghi n'ọlu di iche iche aluru n'ezi omume, nke ayi onwe-ayi luru, zọputa ayi, kama dika ebere-Ya si di, site n'ọsisa nke imu-ọzọ na nke ime ọhu nke Mọ Nsọ nēme, 6 Onye Ọ wusara ayi nime àkù-Ya nile, site n'aka Jisus Kraist Onye-nzọputa-ayi; 7 ka, ebe ewere amara-Ya gua ayi na ndi ezi omume, ka ayi we ghọ ndi-nketa dika olile-anya nke ndu ebighi-ebi si di. 8 Okwu a kwesiri ntukwasi-obi, anamezube kwa ka i kwusie okwu bayere ihe ndia ike, ka ndi kweworo okwu Chineke we tukwasi uche n'ibu ndi-isi n'ọlu ọma. Ihe ndia di nma buru kwa ihe bara madu urù: 9 ma nēze ajuju nzuzu nile, na osuso-ọmumu nile, na esem-okwu nile, na ilu-ọ̀gù nile bayere iwu; n'ihi na ha bu ihe nābaghi urù na ihe-efu. 10 Ju madu nke nārọ òtù, mb͕e i dusiri ya ọdu nke-mbu na nke-abua; 11 ebe i matara na atughariwo obi madu di otú a, ọ nēmehie kwa, ebe ọ bu onye mara onwe-ya ikpé. 12 Mb͕e ọ bula m'gēzitere gi Atemas, ma-ọbu Tikikọs, were inu-ọku-n'obi biakutem rue Naikọpọlis: n'ihi na n'ebe ahu ka m'zubeworo inọgide na mb͕e oyi. 13 Were inu-ọku-n'obi dupu Zinas onye-iwu na Apọlos n'ije-ha, ka ihe ọ bula ghara ifọdu nke ha nēnweghi. 14 Ka ndi-ayi muta kwa ibu ndi-isi n'ọlu ọma ib͕o nkpà nākpa umu-nna-ayi, ka ha ghara ibu ndi nāmighi nkpuru. 15 Ndi nile mu na ha nọ nēkele gi. Kele ndi huru ayi n'anya n'okwukwe. Ka amara dinyere unu nile.

Failimon 1

1 Pọl, onye-nkpọrọ nke Kraist Jisus, na Timọti nwa-nna-ayi nēdegara Failimon akwukwọ, bú onye ayi huru n'anya, onye ayi na ya nālukọ kwa ọlu, 2 nēdega-kwa-ra Apfia nwa-nna-ayi nwanyi, na Akipọs onye ayi na ya nēbukọ agha, na nzukọ Kraist di n'ulo-gi: 3 Amara diri unu na udo nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist puta. 4 Anamekele Chinekem mb͕e nile mb͕e m'necheta gi n'ekperem nile, 5 ebe m'nānu okwu bayere ihu-n'anya-gi na okwukwe-gi, bú okwukwe i kwere n'Onye-nwe-ayi Jisus, na ihu-n'anya i huru ndi nsọ nile; 6 ekpere m'nēkpe bu ka nnwekọ nke okwukwe-gi we ghọ ihe nālusi ọlu ike, nime nmazu nke ezi ihe nile ọ bula nke di nime ayi, rue na Kraist. 7 N'ihi na enwerem ọtutu ọṅù na nkasi-obi n'ihi ihu-n'anya-gi, n'ihi na obi ndi nsọ ezuwo ike site n'aka-gi, nwa-nnam. 8 N'ihi nka, ọ bu ezie na enwerem oké nkwuwa-okwu nime Kraist iwere ihe nke kwesiri nye gi n'iwu, 9 ma n'ihi ihu-n'anya ahu ọ kam nma iriọ aririọ, ebe m'bu nání aha madu dika Pọl, bú agadi, buru kwa onye-nkpọrọ nke Kraist Jisus ub͕u a: 10 ariọm gi aririọ bayere nwa nkem, onye m'muru nime ab͕um, bú Ọnisimọs, 11 onye buri onye nābaghi n'ihe n'ebe i nọ n'oge gara aga, ma ub͕u a ọ bara gi n'ihe, ba-kwa-ram n'ihe: 12 onye m'nēzighachiri gi, ya onye-ya, nke ahu bu, obi nkem: 13 onye mu onwem nēzuberi ijide ka mu na ya nọdu, ka o we nējerem ozi n'ab͕u nke ozi ọma n'ọnọdu gi: 14 ma achọghm ime ihe ọ bula mb͕e i kēkweyeghi; ka idi-nma-gi we ghara idi ka agāsi na ọ di n'uzọ nkpà, kama ka o we di n'uzọ ọchichọ-obi-gi. 15 N'ihi na eleghi anya ọ bu n'ihi nka ka ekewapuru ya n'ebe i nọ nwa oge ntà, ka i we nwe ya ebighi-ebi; 16 ọ dighi kwa ka orù ọzọ, kama ọ kariri orù, ọ di ka nwa-nna ahuru n'anya, nke kachasinu n'ebe m'nọ, ma nke kariri nke ahu nke-uku n'ebe i nọ, nime anu-aru na nime Onye-nwe-ayi kwa. 17 Ya mere ọ buru na i gurum n'onye-nnwekọ, nara ya nke-ọma dika mu onwem. 18 Ma ọ buru na o mejọrọ gi n'uzọ ọ bula, ma-ọbu na o ji gi ugwọ ọ bula, gua ya n'ugwọ m'ji gi; 19 Mu onwem, bú Pọl, were aka nkem de ya n'akwukwọ a, mu onwem gākwughachi ya: ka m'ghara igwa gi na ọ bu kwa onwe-gi ka i jim n'ugwọ tukwasi ihe ọzọ. 20 E, nwa-nnam, kwe ka mu onwem nwe obi-utọ n'aru gi nime Onye-nwe-ayi: me ka obim zuru ike nime Kraist. 21 Ebe m'tukwasiworo obi n'iṅa-nti-gi anamedegara gi akwukwọ, n'ihi na amataram na i gēme ọbuná kari ihe m'nēkwu. 22 Ma ọzọ kwa, dozi-kwa-ram ebe m'gānọ dika ọbìa: n'ihi na anamele anya na agēwerem nye unu n'amara site n'ekpere-unu. 23 Epafras, onye adọkọro mu na ya n'agha nime Kraist Jisus, nēkele gi; 24 ọ bu kwa otú a Mak na Aristakọs na Dimas na Luk, bú ndi mu na ha nālukọ ọlu, nēkele unu. 25 Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist diyere mọ-unu. Amen.

Hibru 1

1 Chineke, mb͕e Ọ gwarari nna-ayi-hà okwu n'oge ochie nime ndi-amuma n'iberibe-akwukwọ di iche iche na uzọ di iche iche, 2 Ọ gwara ayi okwu n'ọgwugwu ubọchi ndia nime Ọkpara, Onye O doro onye-nketa nke ihe nile, Onye O site-kwa-ra n'aka-Ya me uwa nile; 3 Onye, ebe Ọ bu nnwupu nke ebube-Ya na onyinyo nke udi-Ya, ebe O nēbu kwa ihe nile site n'okwu nke ike-Ya, mb͕e Ọ sachasiri nmehie nile ayi, O we nọdu n'aka-nri nke Idi-uku ahu di n'elu; 4 ebe emere Ya-ri ka Ọ ka ndi-mọ-ozi nma n'uzọ ra otú O ketawa aha nke ka nma. 5 N'ihi na ọ̀ bu onye n'etiti ndi-mọ-ozi ka Ọ siri mb͕e ọ bula, Ọkparam ka Gi onwe-gi bu, Mu onwem amuwo Gi ta? ọzọ kwa, Mu onwem gāburu Ya Nna, Ya onwe-ya gābu-kwa-ram Ọkpara? 6 Ma ọzọ kwa, mb͕e ọ bula Ọ gākpọbatawori Ọkpara ahu n'elu-uwa ebe madu bi, Ọ si, Ka ndi-mọ-ozi nile nke Chineke kpọ kwa isi ala nye Ya. 7 Ọ nēkwu kwa ihe bayere ndi-mọ-ozi, si, Onye nēme ndi-mọ-ozi-Ya ka ha buru ifufe, Nēme kwa ndi nējere Ya ozi ka ha buru ọku nēnwu enwu: 8 ma Ọ nēkwu ihe bayere Ọkpara ahu, si, Oche-eze-gi, Chineke, nādiru mb͕e nile ebighi-ebi; Nkpa-n'aka-eze nke izi-ezi ka nkpa-n'aka nke ala-eze-Gi bu kwa. 9 I huru ezi omume n'anya, we kpọ nmebi-iwu asì; N'ihi nka Chineke, bú Chineke-Gi, tere GiManu obi-utọ n'isi kari ndi-nketa-ibe-Gi. 10 Ọzọ kwa, Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi, na mbu ka I tọrọ ntọ-ala nke uwa; Ọlu aka-Gi ka elu-igwe bu kwa: 11 Ha onwe-ha gāla n'iyì; ma Gi onwe-gi nānọgide: Ha nile gāka kwa nká dika uwe; 12 Dika ákwà-nb͕okwasi ka I gāpiakọta kwa ha, Dika uwe, agāb͕anwe kwa ha: Ma Gi onwe-gi bu Onye ahu Nke nādi mb͕e nile, Arọ-Gi nile agaghi-agwu kwa agwu. 13 Ma ọ̀ bu onye n'etiti ndi-mọ-ozi ka O kwuworo okwu bayere ya mb͕e ọ bula, si, Nọdu ala n'aka-nrim, Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-Gi ka ihe-nb͕akwasi ukwu-Gi abua? 14 Hà nile abughi ndi-mọ nēfè òfùfè, ndi eziputara ije ozi n'ihi ndi gaje iketa nzọputa?

Hibru 2

1 N'ihi nka ayi aghaghi iṅabiga nti ókè kari n'ihe anuru, ka aghara ibupu ayi n'ebe ha di ma eleghi anya, dika miri nēbupu ub͕ọ. 2 N'ihi na asi na emere okwu ekwuru site n'ọnu ndi-mọ-ozi ka o guzosie ike, asi kwa na njehie nile ọ bula na aṅaghi-nti nile ọ bula natara nnyeghachi nke ugwọ-ọlu ziri ezi; 3 àyi onwe-ayi gēsi aṅa b͕anari, ma ọ buru na ayi leghara oké nzọputa di otú a anya? bú nzọputa nke eburu uzọ kwu site n'ọnu Onye-nwe-ayi, ndi nuru ya we me ka o guzosie ike rue ebe ayi nọ; 4 Chineke nēso kwa ha nāb͕akọ àmà, site n'ihe-iriba-ama na ọlu-ebube di iche iche, site kwa n'ọlu ike di iche iche, site kwa n'òkìkè nke Mọ Nsọ, dika ọchichọ nke aka Ya si di. 5 N'ihi na ọ bughi n'okpuru ndi-mọ-ozi ka O doro elu-uwa dum madu bi nke gaje ibia, bú nke ayi nēkwu okwu bayere ya. 6 Ma otù onye kwusiri ike n'otù ebe, si, Gini ka madu bu, na I nēcheta ya? Ma-ọbu nwa nke madu, na I nēleta ya? 7 I mere ya ka ọ di kari ndi-mọ-ozi ala nke-ntà; I ji ebube na nsọpuru kpube ya n'isi dika okpu-eze, I do-kwa-ra ya onye-isi ọlu nile nke aka-Gi abua: 8 Ihe nile ka I doro n'okpuru ukwu-ya abua. N'ihi na na n'ido, ihe nile ahu n'okpuru ya, ọ dighi ihe ọ bula Ọ rapuru nke anēdoghi n'okpuru ya. Ma ub͕u a ayi akāhughi ihe nile ahu na edowo ha n'okpuru ya. 9 Ma Onye ahu Nke emere Ya ka ọ di kari ndi-mọ-ozi ala nke-ntà, bú Jisus, Ya ka ayi nēle anya, na ejiwo ebube na nsọpuru kpube Ya n'isi dika okpu-eze n'ihi ahuhu nke ọnwu, ka O we site n'amara Chineke detu ọnwu ire n'ihi madu nile ọ bula. 10 N'ihi na o kwesiri Ya, bú Onye ihe nile di n'ihi Ya, Onye ihe nile site-kwa-ra n'aka-Ya di, ebe O kubatarari ọtutu umu-ndikom n'ebube, ka O site n'ahuhu me ka Onye nēdubà ha na nzọputa-ha zue okè. 11 N'ihi na ma Onye nēdo ha nsọ ma ndi anēdo nsọ, ha nile sitere n'otù Nna: ọ bu kwa n'ihi ihe a ka ihere ikpọ ha umu-nna-Ya adighi-eme Ya, 12 Ọ si, Agamakọrọ umu-nnem aha-Gi, N'etiti nzukọ-Gi k m'gābù abu nye Gi. 13 Ọzọ kwa, Mu onwem ganātukwasi obim na Ya. Ọzọ kwa, Le, Mu onwem na umu-ntakiri Chineke nyerem. 14 Ya mere ebe umu-ntakiri ahu bu ndi nēnwekọ anu-aru na ọbara, Ya onwe-ya n'otù uzọ ahu keta-kwa-ra ihe ndia; ka O we site n'ọnwu me ka onye ahu ghara idi irè, bú onye nwere ike nke ọnwu, ya bu ekwensu; 15 ka O we site kwa n'ọnwu naputa ndi ahu, ka ha ra, bú ndi ewere egwu ọnwu tinye n'ibu-orù n'ogologo ndù-ha nile. 16 N'ihi na ọ bu ihe amara nke-ọma na ọ bughi ndi-mọ-ozi ka Ọ nējide aka, kama Ọ nējide nkpuru Abraham aka. 17 O sitere na ya ji ugwọ ka eme ka O yie umu-nna-Ya n'ihe nile, ka O we ghọ onye-isi-nchu-àjà di ebere, Onye kwesi-kwa-ra ntukwasi-obi, n'ihe nile diri Chineke, ka O we me ka obi Chineke juru n'ebe nmehie nile nke ndi nke Ya di. 18 N'ihi na ebe Ya onwe-ya huworo ahuhu site n'ọnwunwa anwara Ya, Ọ puru iyere ndi anānwa aka.

Hibru 3

1 Ya mere, umu-nnam di nsọ, ndi nketa nke ọkpukpọ nke elu-igwe, tugharinu uche n'Onye-ozi na Onye-isi-nchu-àjà nke nkwuputa-ayi, bú Jisus; 2 na ọbu onye kwesiri ntukwasi-obi n'ebe Onye ahu nọ, bú Onye mere Ya ka Ọ buru Onye-ozi na Onye-isi-nchu-àjà, dika Moses di kwa n'èzi-na-ulo-Ya dum. 3 N'ihi na aguwo Onye a n'Onye kwesiri otuto kari Moses, n'uzọ na otú ahu onye luru èzi-na-ulo nwere nsọpuru kari èzi-na-ulo-ya. 4 N'ihi na èzi-na-ulo ọ bula nwere onye luru ya; ma Onye luru ihe nile bu Chineke. 5 Ọ bu kwa ezie na Moses kwesiri ntukwasi-obi n'èzi-na-ulo-Ya dum dika onye nēje ozi, ka ọ buru ihe-àmà nke ihe nile agaje ikwu; 6 ma Kraist kwesiri ntukwasi-obi dika Ọkpara, Nke bu onye-isi n'èzi-na-ulo-Ya; Onye ayi onwe-ayi bu èzi-na-ulo-Ya, ma ọ buru na ayi jidesie nkwuwa-okwu-ayi na inya-isi nke olile-anya-ayi ike rue ọgwugwu ihe nile. 7 N'ihi nka, dika Mọ Nsọ nāsi, Ta, ọ buru na unu gānu olu-Ya, 8 Unu emela ka obi-unu sie ike, dika n'ikpasu-obi-ilu ahu, Dika emere n'ubọchi ọnwunwa ahu n'ọhia, 9 Ebe nna-unu-hà nwaram na nnwaputa ikem, Hu kwa ọlum ọgu arọ abua. 10 N'ihi nka ọnuma dim n'obi megide ọb͕ọ a, M'we si, Ha nējehie mb͕e nile n'obi-ha: Ma ndi ahu amaghi uzọm nile; 11 Dika M'ṅuru iyí n'iwe m si, Ha agaghi-abà n'izu-ikem ma-ọli. 12 Lezienu anya, umu-nnam, ka ajọ obi nke ekweghi-ekwe ghara idi nime onye ọ bula n'etiti unu ma eleghi anya, n'iwezuga onwe-ya n'ebe Chineke di ndu nọ: 13 kama nāriọritanu ibe-unu aririọ kwa-ubọchi, n'ogologo oge a anākpọ ya Ta; ka obi onye ọ bula n'etiti unu ghara ime etili site n'aghughọ nke nmehie: 14 n'ihi na ayi aghọwo ndi nketa nke Kraist, ma ọ buru na ọ bu ezie na ayi jidesiri nmalite nke ndabere-ayi ike rue ọgwugwu ihe nile: 15 n'oge anēkwu, si, Ta, ọ buru na unu gānu olu-Ya, Unu emela ka obi-unu sie ike, dika n'ikpasu-obi-ilu ahu. 16 N'ihi na òle ndi, mb͕e ha nuru, kpasuru obi-ilu? ọ̀ bughi kwa ndi nile ndi siri n'Ijipt puta site n'aka Moses? 17 Ma òle ndi ka ọnuma di Ya n'obi megide ọgu arọ abua? ọ̀ bughi ndi mehiere, ndi ozu-ha dara nime ọhia? 18 Ma òle ndi ka Ọ ṅuru iyi na ha agaghi-abà n'izu-ike-Ya, ma ọ bughi ndi nēkweyeghi? 19 Ayi riba-kwa-ra ama na ha apughi ibà nime n'ihi ekweghi-ekwe.

Hibru 4

1 Ya mere ka ayi tua egwui ma, ebe nkwa ibà n'izu-ike-Ya fọduru, ọ di onye ọ bula n'etiti unu ọ gādi ka o rughi ya ma eleghi anya. 2 N'ihi na eziwo kwa ayi ozi ọma, ọbuná dika ezi-kwa-ra ha: ma okwu nke ha nuru abaraghi ha urù, n'ihi na ejighi okwukwe tunyere ha na ndi nuru n'ezie. 3 N'ihi na ayi, bú ndi kwere ekwe, nābà n'izu-ike ahu; dika O kwuworo, si, Dika M'ṅuru iyi n'iwem, Ha agaghi-abà n'izu-ikem ma-ọli: ọ bu ezie na alusiri ọlu nile site na ntọ-ala nke uwa. 4 N'ihi na O kwuwo n'otù ebe okwu bayere ubọchi nke-asa otú a, si, Chineke we zuru ike n'ubọchi nke-asa n'ọlu-Ya nile; 5 ọzọ, Ọ si kwa n'ebe a, Ha agaghi-abà n'izu-ikem ma-ọli. 6 Ya mere ebe ọ foduru ka ufọdu ba nime ya, ndi eburu uzọ zie ozi ọma abàghi kwa nime ya n'ihi ekweyeghi-ekwenye, 7 O we kà otù ubọchi ọzọ, nēkwu nime Devid, mb͕e ogologo oge di otú a gasiri, si, Ta, dika ebuworo uzọ kwue, si, Ta, ọ buru na unu gānu olu-Ya, Unu emela ka obi-unu sie ike. 8 N'ihi na asi na Joshua mereri ka ha zuru ike, Ọ gaghi-adi nēkwu okwu bayere ubọchi ọzọ mb͕e ihe ndia gasiri. 9 Ya mere idebe-ubọchi-izu-ike fọduru ndi nke Chineke. 10 N'ihi na onye bataworo n'izu-ike-ya, ya onwe-ya ezuwo kwa ike n'ọlu-ya nile, dika Chineke zuru ike n'ọlu nke aka Ya. 11 Ya mere ka ayi nānu ọku n'obi ibà n'izu-ike ahu, ka onye ọ bula ghara ida n'otù ihe-nṅomi ahu nke ekweyeghi-ekweye. 12 N'ihi na okwu Chineke di ndu, nālusi kwa ọlu ike, di kwa nkọ kari mma-agha ọ bula nke nwere iru abua, nādu kwa rue n'ikewa nkpuru-obi na mọ, ma njikọta ma umi, buru kwa ihe nwere ike ituputa èchichè na izù nile nke obi. 13 Ọ dighi kwa ihe ekère èkè nke nāputaghi ihè n'iru Ya: kama ihe nile b͕a ọtọ buru kwa ihe emegheworo n'anya-Ya, bú Onye ayi gākọrọ akukọ bayere omume-ayi. 14 Ya mere ebe ayi nwere Onye-isi-nchu-àjà di uku, Onye gabigaworo eluigwe nile, bú Jisus Ọkpara Chineke, ka ayi jidesie nkwuputa-ayi ike. 15 N'ihi na ayi enweghi onye-isi-nchu-àjà onye nāpughi iji obi so ayi hukọ ahuhu n'adighi-ike-ayi; kama ayi nwere Onye anwaworo n'ihe nile n'otù uzọ ahu anānwa ayi, ma O mehieghi. 16 Ya mere ka ayi were nkwuwa-okwu biarue oche-eze amara, ka ewe mere ayi ebere, ka ayi we hu kwa amara iyere ayi aka n'oge nkpà.

Hibru 5

1 N'ihi na onye-isi-nchu-àjà ọ bula, esi n'etiti madu weputa ya, ọ bu n'ihi madu ka anēdo ya onye-isi-nchu-àjà n'ihe diri Chineke, ka o we nēche onyinye na àjà di iche iche n'ihi nmehie n'iru Chineke: 2 ọ bu kwa onye puru iwere nwayọ nēmeso ndi nāmaghi ihe ndi nējehie kwa ejehie, n'ihi na adighi-ike di kwa ya onwe-ya gburugburu; 3 n'ihi nka o ji kwa ugwọ iche àjà n'iru Chineke n'ihi nmehie, dika ọ nēchere ndi Israel, otú ahu ọ nēche-kwa-ra onwe-ya. 4 Ọ dighi kwa onye ọ bula nānara nsọpuru a n'onwe-ya, kama mb͕e Chineke nākpọ ya, ọbuná dika Ọ kpọ-kwa-ra Eron. 5 Otú a Kraist enyeghi kwa Onwe-ya otuto ka ewe me Ya onye-isi-nchu-àjà, kama ọ bu Onye siri Ya, Ọkparam ka Gi onwe-gi bu, Mu onwem amuwo Gi ta: 6 dika O si kwu kwa n'ebe di iche, si, Gi onwe-gi bu onye-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebiDika usoro Melkizedek si di. 7 Onye n'ubọchi nke anu-aru-Ya, mb͕e Ọ weresiri ikwa-ákwá siri ike na anya-miri che ekpere na aririọ n'iru Onye ahu puru izọputa Ya n'ọnwu, mb͕e anusi-kwa-ra olu-Ya n'ihi na Ọ turu egwu Chineke, 8 ọ bu ezie na Ọ bu Ọkpara, ma Ọ mutara iṅa-nti-Ya site n'ahuhu nile Ọ huru; 9 ebe emesiri Ya ka O zue okè, O we ghọrọ ndi nile nāṅa Ya nti Onye nēwetara ha nzọputa ebighi-ebi; 10 Onye Chineke nyere aha onye-isi-nchu-àjà dika usoro Melkizedek si di. 11 Onye okwu ayi nwere ikwu bayere ya di uku, di kwa ike isughari asusu, ebe unu ghọworo ndi nwere nti ike. 12 N'ihi na mb͕e unu kwesiri ibu ndi-ozizí n'ihi oge, ọ di unu nkpà ọzọ ka madu zí unu ihe bu ihe-ozizí mbu nke nmalite okwu si n'ọnu Chineke puta; unu aghọwo kwa ndi miri-ara di nkpà, ọ bughi nri siri ike. 13 N'ihi na onye ọ bula nke nēketa miri-ara bu onye akānwaghi ya n'okwu ezi omume; n'ihi na ọ bu nwa ọhu. 14 Ma nri siri ike bu nke ndi tozuru okè, ndi anwaworo nghọta-ha n'ihi omume ha nēme mb͕e dum itule ihe ọma na ihe ọjọ.

Hibru 6

1 N'ihi nka ka ayi rapu okwu nke nmalite nke Kraist, ka anēburu kwa ayi rue n'itozu-okè; ka ayi ghara itọ ntọ-ala ọzọ nke bu nchèghari iji pua n'ọlu nile nwuru anwu, na okwukwe ekwere na Chineke, 2 ozizí nke ime-baptism, na nke ibikwasi-aka-n'isi, na nke nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu, na nke ikpé ebighi-ebi. 3 Nka ka ayi gēme kwa, ma ọ buru na Chineke kwe. 4 N'ihi na ndi enyere ìhè otù mb͕e, ndi detu-kwa-ra onyinye elu-igwe ahu ire, ndi eme-kwa-ra ka ha keta Mọ Nsọ, 5 ndi detu-kwa-ra okwu Chineke ire hu ọ di nma, detu kwa ike nile nke oge gaje ibia ire, 6 ha we dahie, ọ bu ihe anāpughi ime bu ime ka ha buru ndi ọhu ọzọ ichèghari echèghari; ebe ha nākpọgidere onwe-ha Ọkpara Chineke n'obe ọzọ, debe kwa Ya n'ọnọdu-ihere n'iru ọra madu. 7 N'ihi na ala nke ṅuworo miri-ozuzo nke nēzokwasi ya ọtutu mb͕e, nke nēpuputa kwa nkpa-akwukwọ kwesiri ndi ahu, bú ndi anālu kwa ya ọlu n'ihi ha, ala ahu nēkère ngọzi si n'aka Chineke bia: 8 ma ọ buru na ọ nēweputa ogwu na uke, ọ bu ihe ajuru aju, di kwa ọbubu-ọnu nso; nke ọgwugwu-ya bu ire ya ọku. 9 Ma, ndi m'huru n'anya, emewo ka ayi kwere ihe ka nma bayere unu, bú ihe nke ha na nzọputa yikọ kwa, ọ bu ezie na ayi nēkwu otú a: 10 n'ihi na Chineke abughi onye ajọ omume ichezọ ọlu-unu na ihu-n'anya ahu unu gosiri n'ebe aha-Ya di, ebe unu jere ndi nsọ ozi, nēje-kwa-ra ha ozi. 11 Ma ọ nāgu ayi agu ka unu nile n'otù n'otù we nēgosi otù inu-ọku-n'obi ahu ka unu we nwezue olile-anya-ayi rue ọgwugwu ihe nile: 12 ka unu we ghara ighọ ndi ume-ngwu, kama ka unu we buru ndi nēṅomi ndi ahu ndi ji okwukwe na ogologo-ntachi-obi nēketa nkwa ahu. 13 N'ihi na mb͕e Chineke kwere Abraham nkwa, ebe Ọ nēnweghi onye ọ bula ka Ya uku iji ṅu iyí, O ji Onwe-ya ṅu iyí, 14 si, Me-elu-me-ala n'igọzi M'gāgọzi gi, n'ime ka aba uba M'gēme ka i ba uba. 15 Otú a o we nwe ogologo-ntachi-obi, we nata kwa nkwa ahu. 16 N'ihi na madu ji onye ka ha uku aṅu iyi: iṅu-iyi bu-kwa-ra ha nkwubì-okwu nke okwu ọ bula, ime ka o guzosie ike. 17 N'otù uzọ ahu Chineke, ebe Ọ nēzube igosibiga ndi-nketa nke nkwa-Ya ókè kari na izù-Ya bu ihe nādighi-agha agha, O were iṅu-iyí b͕o okwu: 18 ka ayi we were ihe abua nādighi-agha, nke Chineke nāpughi ikwu okwu-ugha nime ha, nwe nkasi-obi siri ike, ayi, bú ndi b͕abàra ijidesi olile-anya ahu ike, bú nke edebere n'iru ayi; 19 bú olile-anya nke ayi nwere dika ihe njiko nke nkpuru-obi, nke bu ihe-ntukwasi-obi na ihe nēguzosi ike, nke nābà kwa nime ebe ahu nke di nime ákwà-nb͕ochi; 20 n'ebe Jisus batara n'ihi ayi dika onye nēbu uzọ b͕a ọsọ, ebe emere Ya ka Ọ buru onye-isi-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebi dika usoro nke Melkizedek si di.

Hibru 7

1 N'ihi na Melkizedek nka, eze Selem, onye-nchu-àjà nke Chineke Onye kachasi ihe nile elu, onye zutere Abraham mb͕e o si n'ob͕ub͕u ndi-eze ahu laghachi, we gọzie ya, 2 onye Abraham kè-kwa-ra otù uzọ n'uzọ iri n'ihe nile nye, (ebe ọ bu mbu, ma asugharia aha-ya, Eze nke ezi omume, buru kwa ma emesia Eze nke Selem, nke bu, Eze nke udo; 3 enweghi nna, enweghi nne, enweghi akukọ osuso-ọmumu, enweghi nmalite ubọchi ma-ọbu ọgwugwu ndu, ma emewo ya ka o yie Ọkpara Chineke), ọ nānọgide onye-nchu-àjà mb͕e nile. 4 Ma lenu otú onye a di uku, onye Abraham, bú nna-ayi mbu, nyere otù uzọ n'uzọ iri n'isi ihe alutara n'agha. 5 Ọ bu kwa ezie na ndi ahu ndi si n'etiti umu Livai puta ndi nānara ọlu onye-nchu-àjà nwere ihe enyere n'iwu inara ndi Israel otù uzọ n'uzọ iri dika iwu-ha si di, nke ahu bu, inara umu-nne-ha, ọ bu ezie na ha esiwo n'afọ Abraham puta: 6 ma onye ahu nke anēsiteghi na ha gu akukọ osuso-ọmumu-ya anarawo Abraham otù uzọ n'uzọ iri, gọzi kwa onye nwere nkwa ndia. 7 Ma apughi ikwugide nka okwu ọ bula na onye ka nma nāgọzi onye dikariri ntà. 8 Ọzọ, n'ebe a madu ndi nānwu anwu nānata otù uzọ n'uzọ iri; ma n'ebe ahu otù onye nānata ha, nke anāb͕ara ya àmà na ọ di ndu. 9 Agēkwu otú a, na ọbuná Livai, onye nānata otù uzọ n'uzọ iri, na o site-kwa-ra n'aka Abraham nye otù uzọ n'uzọ iri; 10 n'ihi na ọ nānọ n'aha nna-ya n'oge ahu, mb͕e Melkizedek zutere ya. 11 Ya mere ọ buru na ewere ọnọdu ndi-nchu-àjà ndi Livai me ka madu zue okè (n'ihi na ndi Israel anatawo iwu n'okpuru ya), nkpà gini ọzọ di ka onye-nchu-àjà di iche bilie dika usoro Melkizedek si di, ka aghara kwa igu ya dika usoro Eron si di? 12 N'ihi na ebe enyeworo ọnọdu ndi-nchu-àjà ahu, ọ di nkpà ka ọdida nke iwu puta kwa. 13 N'ihi na Onye ahu anēkwu ihe ndia bayere Ya eketawo òkè n'ebo di iche, nke ọ dighi onye ọ bula nyeworo aka n'ebe-ichu-àjà site na ya. 14 N'ihi na ọ putawo ìhè na Onye-nwe-ayi esiwo na Juda rọputa; bú ebo nke Moses nēkwughi ihe ọ bula bayere ndi-nchu-àjà nye ya. 15 Ihe ayi nēkwu aputabigawo kwa ìhè ókè nke-uku kari, ma ọ buru na Onye-nchu-àjà di iche ebilie dika oyiyi Melkizedek si di, 16 Onye emeworo Ya ka Ọ buru onye-nchu-àjà, ọ bughi dika iwu nke ihe enyere n'iwu nye anu-aru si di, kama dika ike nke ndu nādighi-agwu agwu si di: 17 n'ihi na anāb͕ara Ya àmà, si, Gi onwe-gi bu onye-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebiDika usoro Melkizedek si di. 18 N'ihi na emere ka ihe eburu uzọ nye n'iwu ghara idi irè n'ihi adighi-ike-ya na abaghi-urù-ya, 19 (n'ihi na iwu ahu emeghi ihe ọ bula ka o zue okè), ewe webata olile-anya ka nma, nke ayi ji biaru Chineke nso. 20 Otú ọ dighi kwa ma ejighi iṅu-iyi, 21 (n'ihi na ọ bu ezie na emewo ha ka ha buru ndi-nchu-àjà nāṅughi iyi; ma emewo Ya onye-ya n'iṅu iyi site n'aka Onye ahu Nke nēkwu okwu bayere Ya, si, Onye-nwe-ayi ṅuru iyi, Ọ gaghi-echèghari kwa uche-Ya, Gi onwe-gi bu onye-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebi); 22 ọ bu kwa n'uzọ ra otú a ka emeworo Jisus ka Ọ buru onye-ala ebe nke ọb͕ub͕a-ndu ka nma. 23 Ọ bu kwa ezie na emewo ndi ahu ka ha buru ndi-nchu-àjà riri nne, n'ihi na ọnwu nēb͕ochi ha inọgide: 24 ma Ya onwe-ya, n'ihi na Ọ nānọgide rue mb͕e ebighi-ebi, O nwere ọnọdu-onye-nchu-àjà-Ya nādighi-agabiga onye ọzọ. 25 O site-kwa-ra na nka pu izọputachasi ndi nēsite n'aka Ya abiakute Chineke, ebe Ọ nādi ndu mb͕e nile iriọ aririọ n'ihi ha. 26 N'ihi na onye-isi-nchu-àjà di otú a kwesiri ayi, Onye di ọcha n'obi, Onye nēnweghi obi ọjọ, Onye anēmerughi emeru, Onye ekewapuworo n'etiti ndi-nmehie, me kwa Ya ka Ọ di elu kari elu-igwe nile; 27 Onye ọ nādighi Ya nkpà kwa-ubọchi, dika ndi-isi-nchu-àjà ahu, ichu àjà di iche iche, mbu n'ihi nmehie nile nke aka ya, emesia n'ihi nmehie nile nke ndi Israel: n'ihi na nka ka O mere nání otù mb͕e, mb͕e Ọ churu Onwe-ya dika àjà. 28 N'ihi na iwu nēdo madu ndi-isi-nchu-àjà, ndi nādighi ike; ma okwu nke iṅu-iyi ahu, nke soro iwu ahu n'azu, nēdo Ọkpara, Onye emeworo Ya ka O zue okè rue mb͕e ebighi-ebi.

Hibru 8

1 Ma isi ihe n'ihe nile ayi nēkwu bu nka: Ayi nwere onye-isi-nchu-àjà di otú a, Onye nọduru ala n'aka-nri nke oche-eze nke Idi-uku ahu di nime elu-igwe, 2 Onye nēfè òfùfè n'ebe nsọ ahu, na n'ezi ulo-ikwū ahu, nke Onye-nwe-ayi mara, ọ bughi madu. 3 N'ihi na anēdo onye-isi-nchu-àjà ọ bula iche onyinye na àjà di iche iche n'iru Chineke: o sitere na nka di nkpà ka Onye-isi-nchu-àjà nka nwe kwa ihe iche n'iru Chineke. 4 Ya mere ọ buru na Ọ nọ n'uwa, Ọ gaghi-abu onye-nchu-àjà ma-ọli, ebe ndi nēche onyinye ahu nile n'iru Chineke dika iwu si di nọ: 5 ndi-nchu-àjà ndi nēkpe ekpere nime ihe-nṅomi na onyinyo nke ebe di n'elu-igwe, dika Chineke duworo Moses ọdú mb͕e ọ gaje imazu ulo-ikwū ahu: n'ihi na Ọ nāsi, Le anya ka i me ihe nile dika ihe-atù ahu si di nke egosiri gi n'ugwu. 6 Ma otú ọ di, O ruwo n'ifè-òfùfè nke ka nma, n'uzọ ra otú Ọ bu kwa onye-ob͕ub͕o nke ọb͕ub͕a-ndu ka nma, bú ọb͕ub͕a-ndu nke enyeworo n'iwu n'elu nkwa ufọdu ka nma. 7 N'ihi na asi na ọb͕ub͕a-ndu mbu ahu adighi ita uta, agaghi-achọwori ebe nye ọb͕ub͕a-ndu nke-abua. 8 N'ihi na mb͕e Ọ nāta ha uta, Ọ si, Le, ubọchi nābia, ka Onye-nwe-ayi kwuru, Mb͕e Mu na ulo Israel na ulo Juda gāb͕a ọb͕ub͕a-ndu ọhu; 9 Ọ bughi dika ọb͕ub͕a-ndu ahu si di nke Mu na ndi bu nna-ha b͕araN'ubọchi M'jidere ha n'aka isi n'ala Ijipt duputa ha; N'ihi na ha onwe-ha anọgideghi n'ọb͕ub͕a-ndum, Mu onwem lefukwara ha anya, ka Onye-nwe-ayi kwuru, 10 N'ihi na nka bu ọb͕ub͕a-ndu nke Mu na ulo Israel gāb͕aMb͕e ubọchi nile ahu gasiri, ka Onye-nwe-ayi kwuru; M'gētiye iwum n'uche-ha, Ọ bu kwa n'obi-ha ka M'gēdekwasi ha dika n'akwukwọ: M'gābu-kwa-ra ha Chineke, Ha onwe-ha gābu-kwa-ram otù ndi: 11 Ha agaghi-izírita onwe-ha ma-ọli, onye ọ bula ọ nēzí onye obodo-ya, Onye ọ bula ọ nēzí kwa nwa-nne-ya, si, Mara Onye-nwe-ayi: N'ihi na ha nile gāmatam, Site n'onye dikarisiri ntà rue onye dikarisiri uku nime ha. 12 N'ihi na M'gēmere ajọ omume nile ha ebere, M'gaghi-echeta kwa nmehie nile ha ọzọ ma-ọli. 13 Mb͕e Ọ nāsi, Ọb͕ub͕a-ndu ọhu, O mewo nke-mbu ka ọ buru ihe ochie. Ma ihe nēme ochie, nke nāka kwa nká, ga-apu-n'anya nso.

Hibru 9

1 Ya mere, ọbuná ọb͕ub͕a-ndu mbu nwere ihe di iche iche aguru n'ihe ziri ezi n'ikpere Chineke, nwe kwa ebe nsọ ya, bú ebe nsọ nke uwa nka. 2 N'ihi na edoziri ulo-ikwū, ulo mbu, nke ihe-idọba-oriọna ahu, na table ahu, na ob͕e achicha ahu anēche n'iru Chineke di nime ya; nke anākpọ Ebe Nsọ. 3 Ma mb͕e agabigasiri ákwà-nb͕ochi nke-abua, ulo-ikwū nke anākpọ Ebe Nsọ kachasi ebe nsọ nile di; 4 nke nwere ebe-ichu-àjà ọla-edo isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na ib͕e nke ọb͕ub͕a-ndu ahu nke amachitara ọla-edo gburugburu n'akuku nile, nke ite ọla-edo nke nwere manna di nime ya, ya na nkpa-n'aka ahu nke Eron nke mara ifuru, na mbadamba nkume abua nke ọb͕ub͕a-ndu ahu; 5 ma n'elu ya cherubim nke ebube di nēnye ebe anēme ka obi Chineke juru ǹdò; nke ayi nēnweghi ike ikwu okwu bayere ha n'otù n'otù ub͕u a. 6 Ma ebe edoziworo ihe ndia otú a, ndi-nchu-àjà nābà n'ulo-ikwū mbu mb͕e nile, nēkpezu ekpere nile ha; 7 ma nání onye-isi-nchu-àjà nābà n'ulo-ikwū nke-abua, nání otù mb͕e n'arọ, nāb͕aghi aka ọbara, nke ọ nēche n'iru Chineke n'ihi onwe-ya, na n'ihi amaghi-ama nile nke ndi Israel: 8 n'ihi na Mọ Nsọ nēgosi nka, na akēmeghi ka uzọ ibà n'ebe nsọ ahu puta ìhè, mb͕e ulo-ikwū mbu ahu nēguzogide ub͕u a: 9 bú ulo-ikwū nke bu ulọ aturu oge nke di ub͕u a; anēche kwa ma onyinye ma àjà n'iru Chineke dika ulo-ikwū ahu si di, bú ihe nāpughi ime onye nēkpe ekpere ka o zu okè n'akuku akọ-na-uche, 10 ebe ha bu nání (ha na ihe-oriri na ihe-ọṅuṅu na ime-baptism di iche iche) ihe di iche iche nke anu-aru aguru n'ihe ziri ezi, enyere n'iwu rue oge imezi ihe. 11 Ma Kraist, ebe Ọ biara ka Ọ buru onye-isi-nchu-àjà nke ezi ihe nile gaje ibia, O sitere n'ulo-ikwū ahu nke ka uku na nke zuru okè kari, ọ bughi nke eji aka me, nke isi-ya bu, ọ bughi nke òkìkè a, 12 O siteghi kwa n'ọbara nke ewu na nke umu-ehi, kama O sitere n'ọbara nke Ya onwe-ya, ba n'ebe nsọ nání otù mb͕e, ebe Ọ chọputara nb͕aputa ebighi-ebi. 13 N'ihi na asi na ọbara nke ewu na nke oke-ehi, na ntu nke nwa-ab͕ọghọ-ehi, mb͕e ọ nēfesa ndi emeruworo emeru, nēdo madu nsọ ime ka anu-aru-ha di ọcha: 14 ọ̀bara Kraist, Onye sitere n'aka Mọ ebighi-ebi che Onwe-ya nātaghi uta n'iru Chineke, gēsi aṅa ghara ime akọ-na-uche-ayi ka ọ di kari ọcha nke-uku ri nne pua n'ọlu nile nwuru anwu ikpere Chineke di ndu? 15 Ọ bu kwa n'ihi nka ka Ọ bu onye-ob͕ub͕o nke ọb͕ub͕a-ndu ọhu, ka ọ gābu, ebe otù Onye nwuru ib͕aputa madu n'aka njehie nile nke di n'okpuru ọb͕ub͕a-ndu mbu ahu, ka ndi akpọworo we nata nkwa nke nketa ebighi-ebi ahu. 16 N'ihi na ebe ọb͕ub͕a-ndu di, ọ di nkpà ka ọnwu nke onye b͕ara ya di ya. 17 N'ihi na ọb͕ub͕a-ndu nēguzosi ike n'elu ndi nwuru anwu: n'ihi na ò nwere uzọ ọ gābu ihe di ike mb͕e ọ bula onye b͕ara ya di ndu? 18 Ya mere emeghi ọbuná ọb͕ub͕a-ndu mbu ahu ọhu nējighi ọbara. 19 N'ihi na mb͕e Moses gwarari ndi Israel nile ihe nile ọ bula enyere n'iwu dika iwu ahu si di, ọ nara ọbara nke umu-ehi na ewu nile, ya na miri na aji-anu uhie na hyssop, we fesa akwukwọ ahu onwe-ya, na ndi Israel nile, 20 si, Nka bu ọbara nke ọb͕ub͕a-ndu ahu nke Chineke nyere unu n'iwu. 21 O we were ọbara ahu fesa kwa ulo-ikwū ahu na ihe nile nke ifè-òfùfè-ya otú ahu. 22 Ọ fọduru ihe ntà ka m'si na eji kwa ọbara eme ihe nile ka ha di ọcha, dika iwu-ayi si di, ọ buru kwa na nwusì ọbara adighi nb͕aghara nmehie adighi. 23 Ya mere ọ di nkpà ka ewere ihe ndia me ka ihe-nṅomi nile nke ihe nile di n'elu-igwe di ọcha; ma ọ di nkpà ka ewere àjà ka ndia nma me ihe ahu onwe-ha nke di n'elu-igwe ka ha di ọcha. 24 N'ihi na Kraist abàghi n'ebe nsọ eji aka me, bú ihe-atù yiri ebe nke bu ebe nsọ n'ezie; kama Ọ bàra n'elu-igwe onwe-ya, igosi Onwe-ya n'iru Chineke n'ihi ayi ub͕u a: 25 ọ bughi kwa ka O we nēche Onwe-ya n'iru Chineke ọtutu mb͕e; dika onye-isi-nchu-àjà nēwere ọbara nābughi nke ya nābà n'ebe nsọ kwa-arọ; 26 n'ihi na asi na ọ di otú a Ọ ghaghi ihu ahuhu ọtutu mb͕e site na ntọ-ala nke uwa: ma otú ọ di, ọ bu nání otù mb͕e nime nruzu nke oge ndia ka emeworo ka Ọ puta ìhè, ka O we site n'ichu Onwe-ya dika àjà me ka nmehie ghara idi irè. 27 Dika ọ bu kwa ihe edebeworo madu ka ha nwua anwu nání otù mb͕e, ma mb͕e nka gasiri ikpé eso ya; 28 n'uzọ ra otú a Kraist, ebe echere Ya n'iru Chineke nání otù mb͕e iburu nmehie nile nke ọtutu madu, Ọ gēme kwa ka ndi nēche Ya hu Ya anya nke ub͕ò abua, ma nmehie adighi ya, ka ewe zọputa ha.

Hibru 10

1 N'ihi na iwu ahu, ebe o nwere nání onyinyo nke ezi ihe ahu nile gaje ibia, ọ bughi ezi oyiyi onwe-ya nke ihe ndia, ha apughi ime ka ndi nābiaru ha nso zue okè mb͕e ọ bula, site n'otù àjà ndia nke ha nēche n'iru Chineke kwa-arọ mb͕e nile. 2 N'ihi na ma ọ dighi otú a, àgaghi-echebìwori ha n'iru Chineke, n'ihi na ndi nēkpe ekpere, ebe emeworo ka ha di ọcha otù mb͕e, ha agaghi-enwe akọ-na-uche ọ bula nke nmehie di iche iche ọzọ? 3 Ma nime àjà ndia ncheta nke nmehie di kwa-arọ. 4 N'ihi na ọbara nke oke-ehi na nke ewu apughi iwepu nmehie. 5 N'ihi nka mb͕e Ọ nābia n'uwa, Ọ si, Àjà na ihe echere n'iru Gi, I chọghi ha, Ma aru ka I kwadebere nyem; 6 Àjà-nsuresi-ọku na àjà achuru bayere nmehie, ha abughi ihe di Gi ezi nma: 7 Mb͕e ahu ka M'siri, Le, abiawom(N'akwukwọ-npiakọta ka edeworo ihe bayerem)Ime ihe I nācho, Chineke. 8 Mb͕e O buru uzọ kwu, si, Àjà na ihe echere n'iru Gi na àjà-nsuresi-ọku na àjà achuru bayere nmehie, I chọghi ha, ha abughi kwa ihe di Gi ezi nma (bú ihe anēche n'iru Chineke dika iwu si di), 9 mb͕e ahu ka Ọ siworo, Le, abiawom ime ihe I nāchọ. Ọ nēwepu nke-mbu, ka O we me ka nke-abua guzo. 10 Ọ bu kwa n'ọchichọ a ka edoworo ayi nsọ site n'iche aru Jisus Kraist n'iru Chineke dika àjà nání otù mb͕e. 11 Onye-nchu-àjà ọ bula nēguzo kwa kwa-ubọchi nēfè òfùfè nēche kwa otù àjà ndia n'iru Chineke ọtutu mb͕e, bú àjà nke nāpughi ihichapu nmehie mb͕e ọ bula: 12 ma Onye ahu, mb͕e O chereri otù àjà n'iru Chineke n'ihi nmehie, O we nọdu n'aka-nri Chineke mb͕e nile; 13 nēle anya n'oge fọduru rue mb͕e agēdo ndi-iro-Ya dika ihe-nb͕akwasi-ukwu nke ukwu-Ya abua. 14 N'ihi na O sitewo n'iche Onwe-ya n'iru Chineke dika àjà otù mb͕e me ka ndi anēdo nsọ zue okè mb͕e nile. 15 Mọ Nsọ nāb͕a-kwa-ra ayi àmà: n'ihi na mb͕e O kwuru, si, 16 Nka bu ọb͕ub͕a-ndu nke Mu na ha gāb͕aMb͕e ubọchi ahu gasiri, ka Onye-nwe-ayi kwuru; M'gētiye iwum n'obi-ha, Ọ bu kwa n'uche-ha ka M'gēdekwasi ha dika n'akwukwọ; mb͕e ahu Ọ si, 17 M'gaghi-echeta kwa nmehie nile ha na nmebi-iwu nile ha ọzọ ma-ọli. 18 Ma ebe nb͕aghara ihe ndia di, iche àjà n'iru Chineke bayere nmehie adighi ọzọ. 19 Ya mere, umu-nnam, ebe ayi nwere nkwuwa-okwu ibà n'ebe nsọ ahu site n'ọbara Jisus, 20 bú uzọ O mere ọhu nye ayi, nke di ọhu di kwa ndu, site n'ákwà-nb͕ochi, nke ahu bu, anu-aru-Ya; 21 ebe ayi nwe-kwa-ra Onye-nchu-àjà uku edoro onye-isi èzí-na-ulo Chineke; 22 ka ayi were obi ezi-okwu biarue nso nime nkwezu nke okwukwe, buru kwa ndi efesaworo ọbara n'obi-ayi pua n'ajọ akọ-na-uche, ndi asachawo-kwa-ra aru-ayi na miri di ọcha: 23 ka ayi jidesie nkwuputa nke olile-anya-ayi ike ka ọ ghara iruda n'ala; n'ihi na Onye ahu Nke kwere nkwa kwesiri ntukwasi-obi: 24 ka ayi nātugharita kwa uche n'aru ibe-ayi ikpasu ihu-n'anya na ọlu ọma di iche iche; 25 ka ayi ghara kwa irapu nzukọ nke onwe-ayi, dika ufọdu nēme, kama ka ayi nādusi ndi ọzọ ọdu ike; ka ayi me kari kwa otú a, n'uzọ ra otú unu nēle ubọchi ahu anya ka ọ nābiaru nso. 26 N'ihi na asi na ayi were ọchichọ-obi nānọ na nmehie mb͕e ayi nataworo nmazu nke ezi-okwu, àjà agāchu bayere nmehie di iche iche afọdughi ọzọ, 27 kama nke fọduru bu oké olile-anya di egwu nke ikpé, ya na ọku nēre ike ike nke gaje iripia ndi nēguzogide Chineke. 28 Onye ọ bula nke juworo iwu Moses gānwu anwu nēmereghi ya ebere n'okwu ndi-àmà abua ma-ọbu atọ: 29 ma àhuhu ahu jọkariri njọ ra aṅa, bú nke agāgu na onye ahu kwesiri ka enye ya, ka unu chère, bú onye nke zọworo Ọkpara Chineke ukwu, onye guwo-kwa-ra ọbara nke ọb͕ub͕a-ndu ahu, bú nke eji do ya nsọ, n'ihe emeruru emeru, onye mewo-kwa-ra Mọ nke amara ihe-ihere? 30 N'ihi na ayi matara Onye ahu Nke siri, Mu nwe ọ́bọ̀, Mu onwem gēnyeghachi. Ọzọ kwa, Onye-nwe-ayi gēkpe ndi-Ya ikpé. 31 Ọ bu ihe di egwu idabà n'aka Chineke di ndu. 32 Ma nēchetanu ubọchi mbu ahu, nke ọ bu nime ha, mb͕e enyesiri unu ìhè, ka unu tachiri obi n'oké ib͕a-nb͕a nke ahuhu di iche iche; 33 n'otù akuku, ebe ewere ita-uta na nkpab͕u di iche iche me unu ka unu buru ihe-nkiri; n'akuku ọzọ, ebe unu ghọrọ ndi nēso ndi nēbi obi otú a nwekọ ahuhu. 34 N'ihi na unu ji obi so ndi nọ n'ab͕u hukọ ahuhu, unu were kwa ọṅù nara npunara ahu nke-ọma, bú nke apunara unu ihe nile unu nwere, ebe unu mara na unu nwere onwe-unu dika ihe unu nwere, bú ihe ka nma nke nādigide kwa. 35 Ya mere unu etufula nkwuwa-okwu-unu, bú ihe nke nwere oké nnyeghachi nke ugwọ-ọlu. 36 N'ihi na ntachi-obi di unu nkpà, ka ọ gābu, mb͕e unu meworo ihe Chineke nāchọ, ka unu we nata nkwa ahu. 37 N'ihi na le ka nwa oge ntà fọduru ra, Onye ahu Nke nābia gābia, Ọ gaghi-anọ kwa ọdù. 38 Ma onye ezi omume nkem gēsite n'okwukwe di ndu: Ọ buru kwa na ọ gēwezuga onwe-ya, ihe-ya adighi nkpuru-obim ezi nma. 39 Ma ayi onwe-ayi adighi n'etiti ndi wezugara onwe-ha ila n'iyì; kama ayi di n'etiti ndi kwere ekwe inweta nkpuru-obi-ha.

Hibru 11

1 Ma okwukwe bu ndabere nke ihe anēle anya, buru kwa nnwaputa nke ihe anāhughi anya. 2 N'ihi na nime okwukwe ahu ka ab͕ara ndi okenye àmà. 3 Okwukwe ka ayi ji ghọta na ewerewo okwu Chineke dozie uwa nile, ya mere esiteghi n'ihe putaworo ìhè kpu ihe ahu anāhu anya. 4 Okwukwe ka Ebel ji che àjà n'iru Chineke nke ka àjà Kain chere nma, nke esitere na ya b͕ara ya àmà na ọ bu onye ezi omume, ebe Chineke b͕ara àmà bayere onyinye-ya nile: o site kwa na nke ahu nēkwu okwu ub͕u a, ọ bu ezie na ọ nwuru anwu. 5 Okwukwe ka eji būbiga Inok ka ọ ghara ihu ọnwu; ahughi kwa ya, n'ihi na Chineke bubigara ya-ri: n'ihi na mb͕e akēbubigaghi ya ab͕aworo ya àmà na ihe ọ nēmeri nātọ Chineke ezi utọ: 6 ma asi na okwukwe adighi ọ bu ihe anāpughi ime, bú ime ihe gātọ Chineke ezi utọ: n'ihi na onye nābiakute Chineke aghaghi ikwe na Ọ di, na Ọ nēgosi kwa Onwe-ya Onye nēnyeghachi ndi nāchọ Ya ugwọ-ọlu. 7 Noa, mb͕e Chineke dusiri ya ọdu bayere ihe akāhughi anya rue oge ahu, ebe ọ turu egwu Chineke, ọ bu okwukwe ka o ji dozie ub͕ọ izọputa èzí-na-ulo-Ya; o site-kwa-ra na nka ma uwa ikpé, we ghọ onye-nketa nke ezi omume ahu nke di n'uzọ okwukwe. 8 Mb͕e akpọrọ Abraham, okwukwe ka o ji ṅa nti ipu je ebe nke ọ gaje inara ka ọ buru ihe-nketa; o we pua, nāmaghi ebe ọ nēje. 9 Okwukwe ka o ji biri dika ọbìa n'ala nke ekwere ya-ri na nkwa, dika ala nābughi nke aka ya, ebe o biri n'ulo-ikwū, ya na Aisak na Jekob, ndi soro ya nēketakọ otù nkwa ahu: 10 n'ihi na ọ nēle anya obodo ahu nke nwere ntọ-ala ahu, nke Chineke bu onye-ọ̀kà-ya na onye luru ya. 11 Okwukwe ka Sera ji nara ike ọbuná imu nwa, ya onwe-ya, mb͕e ọ gasiri oge imu nwa, ebe ọ guru Ya n'Onye kwesiri ntukwasi-obi, bú Onye kwereri nkwa: 12 ọ bu kwa n'ihi nka ka esitere n'otù nwoke mu umu, mb͕e ọ di kwa ka onye nwuru anwu, bú umu bara uba dika kpakpando nke elu-igwe, di kwa ka ájá, nke di n'usọ oké osimiri, nke anāpughi iguta ọnu ya. 13 Ndia nile nwuru n'uzọ okwukwe, ebe ha anataghi nkwa ahu, kama ha huru ha-ri, si kwa n'ebe di anya kele ha, we kwuputa na ha bu ndi-ọbìa na ndi nọ dika ọbìa n'elu uwa. 14 N'ihi na ndi nēkwu ihe di otú a nēgosi na ha nāchọ ala nke gābu nke aka ha. 15 Ọ buru kwa na ọ bu ezie na ha nēcheta ala ahu nke ha si nime ya puta, ha gēnwewori oghere ilaghachi. 16 Ma otú ọ di ub͕u a ha nāb͕aso ala ka nma, nke ahu bu, ala di n'elu-igwe: n'ihi nka ihere ha adighi-eme Chineke, ka akpọ Ya Chineke-ha: n'ihi na O doziworo ha otù obodo. 17 Mb͕e anānwa Abraham, ọ bu okwukwe ka o ji che Aisak n'iru Chineke dika àjà: e, onye ahu nke narari nkwa ahu nke-ọma nēche nwa-nwoke ọ muru nání ya n'iru Chineke dika àjà: 18 bú onye ekwuru okwu bayere ya, si, Nime Aisak ka agākpọ nkpuru-gi: 19 ebe ọ nāgu na Chineke puru ime ka o si ọbuná na ndi nwuru anwu bilie; nke ọ naghachi-kwa-ra ya site n'ebe ahu nime ilu. 20 Okwukwe ka Aisak ji gọzie Jekob na Isọ, ọbuná ngọzi bayere ihe gaje ibia. 21 Mb͕e Jekob nānwu anwu, ọ bu okwukwe ka o ji gọzie umu-ndikom Josef n'otù n'otù; kpọ kwa isi ala nye Chineke, nādabere n'isi nkpa-n'aka-ya. 22 Mb͕e ndu Josef nāgwu, ọ bu okwukwe ka o ji kwue, ihe bayere ọpupu nke umu Israel; nye kwa iwu bayere ọkpukpu-ya. 23 Mb͕e amuru Moses, ọ bu okwukwe ka ndi muru ya ji zobe ya ọnwa atọ, n'ihi na ha huru na nwatakiri ahu mara nma; ha atughi kwa egwu ihe eze ala ahu nyere n'iwu. 24 Mb͕e Moses toruru madu, ọ bu okwukwe ka o ji ju ka akpọ ya nwa-nwoke nke nwa-nwanyi Fero; 25 n'ihi na ọ chọrọ ka emejọkọ ya na ndi nke Chineke, kama inwe ihe-utọ nke nmehie na nwa oge; 26 ebe ọ guru ita-uta nke Kraist-ayi n'àkù dikariri àkù nile nke Ijipt uku: n'ihi na ọ wepuru anya-ya le nnyeghachi nke ugwọ-ọlu ahu. 27 Okwukwe ka o ji rapu Ijipt, n'ihi na ọ tughi egwu ọnuma nke eze ahu: n'ihi na ọ nọgidesiri ike, dika ọ nāhu Onye ahu Nke anāpughi ihu Ya anya. 28 Okwukwe ka o ji me ememe ngabiga ahu, ya na nwusa ọbara ahu, ka onye ahu nēbibi umu eburu uzọ mu we ghara imetu ha aka. 29 Okwukwe ka ha ji gabiga n'etiti oké osimiri Uhie dika ọ bu ala kpọrọ nku: ma elomiri ndi Ijipt mb͕e ha nwara igabiga ya. 30 Okwukwe ka mb͕idi nke Jeriko ji da, mb͕e agasiri ha gburugburu ubọchi asa. 31 Okwukwe ka Rehab, bú nwanyi nākwa iko, ji ghara iso ndi nēkweyeghi ekweye lakọ n'iyi, ebe o were udo nata ndi ledoro obodo ahu anya. 32 Gini ka m'gēkwu kwa ọzọ? n'ihi na oge gāgwunarim ma ọ buru na akọm akukọ bayere Gideon, Berak, Samson, Jefta; ha na Devid na Samuel na ndi-amuma: 33 ndi sitere n'okwukwe lub͕u ala-eze, lu ọlu ezi omume, nata nkwa di iche iche, kpuchita ọnu ọdum, 34 menyu ike ọku, b͕anari iru mma-agha, ndi esitere n'okwukwe me ka ha di ike site n'adighi-ike, me ka ha di ike n'agha, ndi sitere n'okwukwe chulaga usu-ndi-agha nke ndi ala ọzọ. 35 Ndinyom natara ndi-ha ndi nwuru anwu site na nbilite-n'ọnwu: ma etib͕uru ndi ọzọ, ebe ha juru inata nb͕aputa-ha; ka ha we nata nbilite-n'ọnwu ka nma: 36 ma ndi ọzọ ka anwara ọnwunwa nke ihe-ọchi na utari, e, tukwasi ihe ndia, nke ab͕u na ulo-nkpọrọ: 37 aturu ha nkume, akwọwara ha, anwara ha, ewere iru mma-agha b͕ue ha: ha yiri akpukpọ aturu na akpukpọ ewu nējeghari; ebe ha nọ na nkpà, anākpab͕u ha, anēmejọ ha 38 (ndi uwa nēkwesigh), nāwaghari n'ọhia na ugwu na ọb͕à na ọnu nke ala. 39 Ndia nile, ọ bu ezie na ab͕ara ha àmà site n'okwukwe-ha, ma ha anataghi nkwà ahu, 40 n'ihi na Chineke buru uzọ leputa ihe ka nma bayere ayi, ka aghara ime ka ha zue okè ma asi na ayi anọghi ya.

Hibru 12

1 Ya mere ka ayi onwe-ayi, ebe ayi nwere oké ìgwè ndi-àmà di otú a ndi b͕ara ayi gburugburu dika igwe-oji, ka ayi tupu kwa ibu nile ọ bula, ya na nmehie ahu nke nārapara ayi n'aru nke-uku, ka ayi were kwa ntachi-obi b͕a ọsọ ahu edebere ayi n'iru, 2 nēlegide Jisus anya, bú onye-ndú na onye-nmezu nke okwukwe-ayi, Onye n'ihi ọṅù edebere n'iru Ya nātachi obi n'obe-Ya, nēlelì ihere anya, O we nọdu n'aka-nri nke oche-eze Chineke. 3 na n'ihi ya, tugharianu uche n'Onye ahu Nke tachiworo obi na nkwugide di otú a, bú nke ndi-nmehie nēkwugide onwe-ha, ka ike ghara igwu unu, unu we da #mbà na nkpuru-obi-unu. 4 Unu akēguzogideghi rue ọbara, n'ib͕a nb͕a megide nmehie: 5 unu echezọsiwo kwa okwu nkasi-obi ahu, nke nāgwa unu okwu dika anāgwa umu-ndikom, si, Nwam, agula ya n'ihe ntà, bú ozizí Onye-nwe-ayi nēzí gi site n'inye gi ahuhu, Ada-kwa-la #mbà mb͕e Ọ nātu gi nmehie-gi n'anya; 6 N'ihi na onye Onye-nwe-ayi huru n'anya ka Ọ nēzí ihe site n'inye ya ahuhu, O nāpia kwa nwa ọ bula Ọ nānata utari. 7 Nātachinu obi ka ewe zí unu ihe site n'inye unu ahuhu; n'ihi na Chineke nēmeso unu dika umu; n'ihi na ònye bu nwa ahu nna-ya nādighi-ezi ya ihe site n'inye ya ahuhu? 8 Ma ọ buru na adighi-ezí unu ihe site n'inye unu ahuhu, nke emeworo unu niile ka ha buru ndi-nketa, ya mere unu bu umu iko, unu abughi kwa umu n'ezie. 9 Ọzọ kwa, ayi nwere ndi bu nna nke anu-aru-ayi izí ayi ihe site n'inye ayi ahuhu, ayi we sọpuru ha: àyi agaghi-edo kari onwe-ayi nke-uku n'okpuru Nna nke mọ-ayi, we di ndu? 10 N'ihi na ndi ahu nezí ayi ihe site n'inye ayi ahuhu n'ezie ubọchi ole-na-ole otú ọ di ha nma; ma Ya onwe-ya nēzí ayi ihe site n'inye ayi ahuhu ka o we bara ayi urù, ka ayi we keta idi-nsọ-Ya. 11 Ozizí nile site n'inye ahuhu nādi ka ihe nādighi-eweta ọṅù n'oge di ub͕u a, kama nwuta: ma emesia ọ nēnyeghachi ndi ahu ewereworo ya nwaputa ha nkpuru nke di n'udo, bú nkpuru nke ezi omume. 12 N'ihi nka menu aka nēruda eruda na ikperè nwuworo anwu ka ha guzozie: 13 kwa-kwa-ranu ukwu-unu uzọ nke nēguzozi ọtọ, ka ewe ghara ime ka ukwu nke di ngwurọ kwopu, kama ka ewe me ka ọ di ike. 14 Nāb͕asonu udo n'ebe madu nile nọ, ya na ido-nsọ ahu, nke onye ọ bula agaghi-ahu Onye-nwe-ayi anya ma o nweghi ya: 15 nēle-kwa-nu anya nke-ọma, ma ọ di onye ọ bula nke nērughi amara Chineke; ka nkpọrọgwụ ilu obula we ghara ipuputa we sob͕ue unu; ewe were nkpọrọgwụ ahu meru ọra madu; 16 ma ọ di onye ọ bula nke nākwa iko, ma-ọbu nke emeruru emeru, dika Isọ, onye rere di-ọkpara ya onwe-ya bu n'ọnọdu otù oriri. 17 N'ihi na unu matara na ọbuná mb͕e ọ chọrọ iketa ngọzi ahu mb͕e emesiri, ajuru ya (n'ihi na ọ hughi ọnọdu nke nchèghari), ọ bu ezie na o were anya-miri chọsie ya ike. 18 N'ihi na unu abiarughi ọku nke apuru idatu ya aka na nke afunwuworo, na itiri, na ọchichiri, na oké ifufe, 19 na udà opì, na olu okwu; nke ndi nuru ya riọrọ ka aghara itukwasiri ha okwu ọ bula ọzọ: 20 n'ihi na ha anānagideghi ihe enyere n'iwu, bú, Asi na ọbuná anu-ulo emetu ugwu ahu, agēwere nkume tub͕ue ya; 21 ka ihe ahu anēkiri si di kwa egwu nke-uku, Moses siri, Anamatu oké egwu, aru ma-kwa-ram jijiji: 22 kama unu abiaruwo ugwu Zaion, na obodo nke Chineke di ndu, bú Jerusalem nke di n'elu-igwe, na ọtutu ndi anāpughi iguta ọnu, 23 bú nb͕akọ ọra ndi-mọ-ozi nile, na nzukọ nke ndi eburu uzọ muputa ndi edeworo aha-ha n'akwukwọ n'elu-igwe, na Chineke, bú Onye-ikpé ọra madu, na mọ nke ndi ezi omume emeworo ka ha zue okè, 24 na Jisus, bú onye-ob͕ub͕o nke ọb͕ub͕a-ndu ọhu, na ọbara nke nfesa nke nēkwu nke-ọma kari nke ọbara Ebel kwuru. 25 Lezienu anya ka unu ghara iju Onye ahu nēkwu okwu. N'ihi na asi na ndi ahu ab͕anarighi Ya, mb͕e ha juru Onye ahu Nke nādu ha ọdú n'elu uwa, ayi onwe-ayi agaghi-ab͕anari Ya kari nke-uku, bú ndi nāb͕akuta Onye ahu azu Nke nādu ọdú site n'elu-igwe: 26 Onye olu-Ya mere uwa ka o me nkpatu mb͕e ahu: ma ub͕u a ka O kweworo nkwa, si, Nání otù mb͕e ọzọ fọduru nke Mu onwem gēji me ka ọ bughi nání uwa ma jijiji, kama elu-igwe kwa. 27 Ma okwu nka, Nání otù mb͕e ọzọ fọduru, nēgosi nbubiga nke ihe ahu nke anēme ka ha me nkpatu, dika nke ihe emeworo, ka ihe ahu nke anēmeghi ka ha me nkpatu we digide. 28 N'ihi nka, ebe ayi nānata ala-eze nke anāpughi ime ka o me nkpatu, ka ayi nwe amara, ka ayi we site na ya were egwu Chineke na ujọ kpe ekpere n'uzọ nke gātọ Chineke utọ: 29 n'ihi na Chineke-ayi bu ọku nērechapu.

Hibru 13

1 Ka ihu-n'anya-unu n'ebe umu-nna-unu nọ nādigide. 2 Unu echezọla ile ndi-ọbìa nke-ọma: n'ihi na ufọdu esitewo na nka le ndi-mọ-ozi ọbìa nāmaghi ama. 3 Nēchetanu ndi nọ n'ab͕u, dika ndi ekekọworo unu na ha n'ab͕u; nēchetanu ndi anēmejọ, dika ndi unu onwe-unu nọ kwa n'aru. 4 Ka ilu-di-na-nwunye buru ihe anāsọpuru n'etiti unu nile, ka ihe-ndina-unu buru kwa ihe adighi-emeru emeru: n'ihi na Chineke gēkpe ndi nākwa iko ikpé, ha na ndi nākwa iko, bú ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di. 5 Ka ọchichọ-obi-unu ghara idi n'ihu-n'anya ego; ka afọ ju unu n'ihe unu nwere ub͕u a: n'ihi na Ya onwe-ya ekwuwo, si, M'gaghi-ara gi aka ma-ọli, M'gaghi-arapu kwa gi ma-ọli. 6 Ya mere ayi were obi-ike si, Onye-nwe-ayi bu onye nēyerem aka; Gini ka madu gēmem? 7 Nēchetanu ndi-isi-unu, bú madu ndi gwara unu okwu Chineke; nēkiri-kwa-nu ọpupu nke ibi-obi-ha, nēṅomi-kwa-nu okwukwe-ha. 8 Jisus Kraist di otù aka ahu nnyahu na ta, ma rukwa mb͕e nile ebighi-ebi. 9 Unu ekwela ka ewere ozizí di iche iche nke si kwa n'ebe ọzọ puta duhie unu: n'ihi na ọ di nma ka ewere amara me ka obi-unu guzosie ike; ka aghara iwere ihe-oriri, nke ọ dighi mb͕e ha bara ndi jeghariri nime ha urù. 10 Ayi nwere ebe-ichu-àjà, nke ndi nēkpe ekpere n'ulo-ikwū Chineke nēnweghi ike iri ihe si nime ya puta. 11 N'ihi na ozu anu nile nke anēwebata ọbara-ha n'ebe nsọ site n'aka onye-isi-nchu-àjà dika àjà achuru bayere nmehie, anērechapu ozu ahu ọku n'azu ọmuma-ulo-ikwū. 12 N'ihi nka Jisus, ka O we site n'ọbara nke Ya onwe-ya do ndi nke Ya nsọ, Ọ hu-kwa-ra ahuhu n'azu ọnu-uzọ-ama nke obodo. 13 Ya mere, ka ayi pukuru Ya n'azu ọmuma-ulo-ikwū, nēbu ita-uta-Ya. 14 N'ihi na ayi enweghi obodo n'ebe a nke nādigide, kama ayi nāchọ obodo ahu nke gaje ibia. 15 Ya mere, ka ayi site n'aka-Ya nāchu àjà, bú otuto, nye Chineke mb͕e nile, nke ahu bu, nkpuru eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwuputa nye aha-Ya. 16 Ma unu echezọla ime ihe di nma na ime ka unu na ndi ọzọ nwekọ ihe-unu: n'ihi na àjà di otú a nātọ Chineke ezi utọ. 17 Nēkweyenu ndi-isi-unu, nēdo-kwa-nu onwe-unu n'okpuru ha: n'ihi na ndi ahu nāmu anya n'ihi nkpuru-obi-unu, dika ndi gāza ajuju bayere unu: ka ha we were ọṅù me nka, ghara isu udè: n'ihi na nka gābu ihe nābaghi unu urù. 18 Nēkpenu ekpere bayere ayi: n'ihi na emere ka ayi kweye na ayi nwere akọ-na-uche ọma, ebe ayi nāchọ ibi obi nke-ọma n'ihe nile. 19 Ma anamariọbiga unu ókè kari ime nka, ka ewe werem nyeghachi unu ọsọsọ kari. 20 Ma Chineke nke udo, Onye were ọbara nke ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ahu si na ndi nwuru anwu kughachi oké Onye-ọzùzù-aturu nke aturu-Ya, bú Onye- nwe-ayi Jisus, 21 Ya me ka unu zue okè n'ezi ihe nile ọ bula ime ihe Ọ nāchọ, nēme nime ayi ihe nātọ ezi utọ n'iru Ya, site n'aka Jisus Kraist; Onye otuto nile diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen. 22 Ma ariọm unu, umu-nnam, nānagidenu okwu aririọ a: n'ihi na anamewere okwu ole-na-ole degara unu akwukwọ-ozi. 23 Maranu na arapuwo nwa-nna-ayi Timọti ka ọ la; ọ buru kwa na ọ gābia na mb͕e ntà, mu na Ya gāhu unu anya. 24 Kelenu ndi-isi-unu nile na ndi nsọ nile. Ndi Itali nēkele unu. 25 Ka amara diyere unu nile. Amen.

Jemes 1

1 Jemes, orù nke Chineke na nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, nēdegara unu akwukwọ, bú ebo-ayi iri na abua ndi nọ na Nb͕asa ahu, nēkele unu. 2 Guanu ya n'ọṅù nile, umu-nnam, mb͕e ọ bula unu dabàra n'ọwunwa di iche iche; 3 ebe unu mara na nnwaputa nke okwukwe-unu nāluputa ntachi-obi. 4 Ma ka ntachi-obi luzue ọlu-ya, ka unu we tozue okè dizu kwa nma, buru ndi ọ dighi ihe ọ bula fọduru nke unu nēnweghi. 5 Ma ọ buru na amam-ihe fọduru onye ọ bula nime unu inwe, ya riọ n'aka Chineke, Onye nēnye madu nile n'afọ-ofufọ, nātaghi kwa uta; agēwere kwa ya nye ya. 6 Ma ya riọ n'okwukwe, ghara inwe obi abua: n'ihi na onye nwere obi abua yiri ebili-miri nke oké osimiri mb͕e ifufe nēfeghari ya, anātuli kwa ya elu. 7 N'ihi na, ka madu ahu ghara ichè na ọ gānata ihe ọ bula n'aka Onye-nwe-ayi; 8 ọ bu nwoke nwere uche abua, onye nādighi-eguzo n'otù ebe n'uzọ-ya nile. 9 Ma ka nwa-nna nke nọ n'ọnọdu di ala nya isi n'ọnọdu-ya di elu: 10 ma ka ọgaranya nya isi na emere ya ka ọ la ala: n'ihi na dika uzari ahihia ọ gāgabiga. 11 N'ihi na anyanwu nāwalita, ifufe di ọku eso ya, o we kpọnwua ahihia; uzari-ya we dapu, nmá nke iru-ya we la n'iyì: otú a ka ọgaranya gātalata kwa n'ije-ya nile. 12 Ngọzi nādiri nwoke onye nātachi obi n'ọnwunwa: n'ihi na mb͕e anwaputaworo ya, ọ gānata okpu-eze ahu, bú ndu, nke Onye-nwe-ayi kwere nkwa inye ndi huru Ya n'anya. 13 Ka onye ọ bula ghara isi, mb͕e anānwa ya, Anēsite n'aka Chineke anwam: n'ihi na Chineke bu Onye anāpughi iwere ihe ọjọ nwa Ya, Ya onwe-ya adighi-anwa kwa onye ọ bula: 14 kama anānwa onye ọ bula mb͕e agu ihe ọjọ nke aka ya nādọkpufu ya, ewe rafue ya. 15 Mb͕e ahu agua ihe ọjọ ahu, mb͕e ọ tuworo ime, o we muputa nmehie: nmehie ahu, mb͕e o tozuru okè, o we muputa ọnwu. 16 Unu ekwela ka eduhie unu, umu-nnam ndi m'huru n'anya. 17 Ezi onyinye ọ bula na ihe ọ bula zuru okè nke enyere enye si n'elu bia, ebe o si n'aka Nna nke ìhè ridata, Onye ọghugha ọ bula nāpughi idi n'ebe Ọ nọ, ma-ọbu onyinyo nke nchighari nēweta. 18 N'ihi na O zubere ya O were okwu nke ezi-okwu muputa ayi, ka ayi we buru otù aha nkpurú mbu nke ihe O kère èkè. 19 Unu matara nka, umu-nnam ndi m'huru n'anya. Ma ka madu ọ bula buru onye nānu ihe ọsọsọ, onye nādighi ngwa ikwu okwu, nādighi kwa ngwa iwe iwe: 20 n'ihi na iwe madu adighi-alu ọlu ezi omume Chineke. 21 N'ihi nka tupunu inyi nile na njubiga-ókè nile nke ihe ọjọ, were-kwa-nu nwayọ nara okwu ahu nke akuworo nime unu dika n'ubi, nke puru izọputa nkpuru-obi-unu. 22 Ma ghọnu ndi nēme okwu ahu, unu abu-kwa-la ndi nānu nání, ndi nārafu onwe-unu. 23 N'ihi na asi na onye ọ bula bu onye nānu okwu ahu, ma ọ bughi onye nēme ya, onye ahu yiri nwoke nke nēkiri iru-ya n'enyo, bú iru o nwere mb͕e amuputara ya: 24 n'ihi na o kiriri onwe-ya, ọ puwo kwa, ngwa ngwa o we chezọ aha madu ọ bu. 25 Ma onye nyochaworo nime iwu zuru okè, bú iwu nke inwe-onwe-ya, nke nānọgide kwa otú a, ghara ighọ onye nānu anu nke nēchezọ, kama ọ bu onye nēme eme nke nālu ọlu, onye a gābu onye-ngọzi n'omume-ya. 26 Ọ buru na onye ọ bula nēchè na ya bu onye nēkpere Chineke, mb͕e ọ dighi-akwa ire nke ya nga, kama ọ nāghọ obi-ya aghughọ, okpukpe-Chineke nke onye a bu ihe-efu. 27 Okpukpe-Chineke nke di ọcha nke anēmerughi kwa emeru n'iru Chineke-ayi, bú Nna-ayi, bu nka, ileta umu-nb͕ei na ndinyom di-ha nwuru nime nkpab͕u-ha, na idebe onwe-ya nēnweghi ntupọ site n'uwa.

Jemes 2

1 Umu-nnam, unu enwela okwukwe nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, bú Onye-nwe ebube, n'ile-madu-anya-n'iru. 2 N'ihi na asi na otù nwoke nke yiri nb͕a-aka ọla-edo na uwe mara nma nke-uku bata na nzukọ-unu, ma asi na otù ob͕eye nke yiri uwe ruru inyi bata kwa; 3 ọ buru kwa na unu ele onye ahu nke nēyi uwe mara nma nke-uku anya, si, Gi onwe-gi nọdu ala n'ebe a nke-ọma; unu we si ob͕eye ahu, Gi onwe-gi guzo n'ebe a, ma-ọbu nọdu ala n'okpuru ihe-nb͕akwasi-ukwum; 4 ùnu enweghi obi abua nime onwe-unu, ùnu aghọghi kwa ndi-ikpé nēchè èchìchè ọjọ? 5 Nurunu, umu-nnam ndi m'huru n'anya; Chìneke arọputaghi ndi bu ob͕eye n'ihe nke uwa ka ha buru ndi-ọgaranya n'okwukwe, buru kwa ndi-nketa nke ala-eze ahu nke O kwere nkwa inye ndi huru Ya n'anya? 6 Ma unu onwe-unu mere ob͕eye ahu ihe-ihere. Ǹdi-ọgaranya adighi-emeso unu dika ha bu ndi-nwe-unu? ọ̀ bughi kwa ha onwe-ha nādọkpuru unu ga ulo ikpé? 7 Ọ̀ bughi ha onwe-ha nēkwulu aha ọma ahu nke aguru unu? 8 Otú ọ di, ọ buru na unu edebezu iwu nke Eze-ayi, dika ihe edeworo n'akwukwọ nsọ si kwu, Hu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi, unu nēme nke-ọma: 9 ma ọ buru na unu ele madu anya n'iru, ọ bu nmehie ka unu nēme, n'ihi na iwu ahu nātu unu nmehie-unu n'anya dika ndi-njehie. 10 N'ihi na onye ọ bula nke gēdebe iwu ahu dum, ma ọ su ngọngọ n'otù ihe, emewo ya ka ọ buru onye ikpé iwu ahu nile mara. 11 N'ihi na Onye ahu Nke siri, Akwala iko, Ọ si-kwa-ra, Eb͕ula madu. Ma ọ buru na i kwaghi iko, ma i nēb͕u madu, i ghọwo onye-njehie iwu. 12 Nēkwunu otú a, nēme-kwa-nu otú a, dika ndi agaje iwere iwu nke inwe-onwe-onye kpe unu ikpé. 13 N'ihi na ọ bu ikpé nke ebere nādighi ya ka agēkpe onye nēmeghi ebere: ebere nānyara ikpé isi. 14 Ùrù gini ka ọ bara, umu-nnam, ma ọ buru na onye ọ bula asi na o nwere okwukwe, ma o nweghi ọlu? òkwukwe ahu puru izọputa ya? 15 Ọ buru na nwa-nna-nwoke ma-ọbu nwa-nna-nwanyi b͕a ọtọ, nēnweghi kwa ihe-oriri gēzuru ya kwa-ubọchi, 16 ma otù onye n'etiti unu si ha, Labanu n'udo, nyanu ọku, riju-kwa-nu afọ; ma unu enyeghi ha ihe nākpa aru-ha; ùrù gini ka ọ bara? 17 Ọbuná otú a okwukwe, ma ọ buru na o nweghi ọlu, ọ bu ihe nwuru anwu n'onwe-ya. 18 Ma otù onye gāsi, Gi onwe-gi nwere okwukwe, mu onwem nwe-kwa-ra ọlu: gosim okwukwe-gi ma ọlu-gi adighi ya, mu onwem gēsite kwa n'ọlum gosi gi okwukwem. 19 Gi onwe-gi kwere na Chineke bu otù; i nēme nke-ọma: ndi-mọ ọjọ kwe-kwa-ra, we kuja. 20 Ma ì nāchọ ka i mara, gi madu efu, na okwukwe bu ihe nādighi-aluputa ihe ma ọlu adighi ya? 21 Èsiteghi n'ọlu gu Abraham nna-ayi n'onye ezi omume, mb͕e ọ churu Aisak nwa-ya nwoke n'elu ebe-ichu-àjà? 22 I huwo na okwukwe-ya soro ọlu-ya lukọ ọlu, esite-kwa-ra n'ọlu ahu me ka okwukwe ahu zue okè; 23 ewe mezu ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nke nāsi, Abraham we kwere okwu Chineke, ewe gua ya nye ya n'ezi omume; ewe kpọ ya eyì nke Chineke. 24 Unu ahuwo na anēsite n'ọlu gu madu n'onye ezi omume, adighi-esite kwa nání n'okwukwe. 25 Ma n'uzọ di otù a èsiteghi kwa n'ọlu gu Rehab, bú nwanyi nākwa iko, n'onye ezi omume, mb͕e ọ kpọbatara ndi-ozi ahu, we zipu ha n'uzọ di iche? 26 N'ihi na dika aru bu ihe nwuru anwu ma mọ adighi ya, ọbuná otú a okwukwe bu ihe nwuru anwu ma ọlu adighi ya.

Jemes 3

1 Unu aghọla ọtutu ndi-ozizí, umu-nnam, ebe unu matara na ayi gānata ikpé ka uku. 2 N'ihi na ayi nile nāsu ngọngọ n'ọtutu ihe. Ọ buru na onye ọ bula asughi ngọngọ n'okwu, onye ahu bu nwoke tozuru okè, buru kwa onye puru ikwa aru-ya dum nga. 3 Ma ọ buru na ayi etiye bridle inyinya-ayi n'ọnu-ha, ka ha we kweyere ayi, ayi nēchighari kwa aru-ha dum. 4 Le, ub͕ọ kwa, ọ bu ezie na ha di uku otú a, oké ifufe nēfeghari kwa ha, ma umara isi-ub͕ọ dikarisiri ntà nēchighari ha, ebe ọ bula uche onye-isi ub͕ọ nāchọ. 5 Otú a ire bu kwa ihe ntà di n'aru, ọ nānya kwa isi oké ihe. Le, otú oké ọhia ra uku, bú nke ọku dikarisiri ntà nēme ka o nwuru ọku! 6 Ire bu kwa ọku, bú uwa ahu nke ajọ omume: ire nēguzo n'etiti ihe nile di ayi n'aru dika ihe nēnye aru dum ntupọ, nke nāfunwu kwa ihe nāga dika amuru ya ọku, ọku ala-mọ bu kwa ihe nāfunwu ire ahu ọku. 7 N'ihi na aha nile ọ bula nke anu na anu-ufe, nke ihe nākpu akpu na ihe di n'oké osimiri, ha nile ka ihe akpọrọ madu nēmeju anya, o mejuwo kwa ha anya: 8 ma ọ dighi onye ọ bula n'etiti madu puru imeju ire anya; ọ bu ihe ọjọ nke nādighi-eguzo n'otù ebe, ọ bu ihe juputara na irè-agwọ nēweta ọnwu. 9 Ọ bu nka ka ayi ji nāgọzi Onye-nwe-ayi, bú Nna-ayi; nka ka ayi ji kwa nābu madu ọnu, ndi ekèworo dika oyiyi Chineke si di: 10 n'otù ọnu ahu ka ngọzi na ọbubu-ọnu si puta. Umu-nnam, o kwesighi ka ihe ndia di otú a. 11 Ìsi-iyi nēsi n'otù ọnu ahu suputa miri nātọ utọ na miri nēlu ilu? 12 Umu-nnam, ọ̀ gābu na osisi fig puru imi olive, ma-ọbu na osisi vine puru imi fig? miri nnú apughi kwa isuputa miri nātọ utọ. 13 Ònye bu onye-amam-ihe nke nāghọta kwa ihe n'etiti unu? ya site n'ibi-obi ọma ya gosi ọlu-ya nile nime idi-nwayọ nke amam-ihe. 14 Ma ọ buru na unu nwere ekworo di ilu na ikpa-iche-iche n'obi-unu, unu anyala isi, unu ekwu-kwa-la okwu-ugha megide ezi-okwu. 15 Amam-ihe a abughi amam-ihe nke nēsi n'elu ridata, kama ọ bu nke uwa, buru kwa nke nkpuru-obi madu nāchi, buru kwa ihe ndi-mọ ọjọ nēzí. 16 N'ihi na ebe ekworo na ikpa-iche-iche di, n'ebe ahu ka ib͕a-aghara na omume nile ọ bula nke nādighi nma di. 17 Ma amam-ihe ahu nke si n'elu bia buru uzọ di ọcha, emesia ọ di udo, nwe obi-ọma, nēkweye okwu nke-ọma, juputa n'ebere na ezi nkpuru, nēnweghi obi-abua, nēnweghi iru-abua. 18 Ma ọ bu nkpuru nke ezi omume ka ndi nēme udo nāgha n'udo.

Jemes 4

1 Òle ebe ibu-agha si bia, òle ebe kwa ilu-ọ̀gù si bia, bú nke di n'etiti unu? ọ̀ bughi n'ebe ahu, bú ihe-utọ nile unu nke nēbu agha n'ihe nile di unu n'aru, ka ha si bia? 2 Agu nāgu unu, ma unu enwegh: unu nēb͕u madu, nēkwo kwa ekworo, unu apughi kwa ihu ihe unu chọrọ: unu nālu ọ̀gù, nēbu kwa agha; unu enweghi, n'ihi na unu ariọghi. 3 Unu nāriọ, ma unu adighi-anata ihe, n'ihi na unu nāriọ n'obi ọjọ, ka unu we mefu ya n'ihe-utọ nile unu. 4 Unu ndi nākwa iko, ùnu amataghi na ibu eyì nke uwa bu ibu onye-iro nke Chineke? Ya mere onye ọ bula nke zubere ibu eyì nke uwa nēdo onwe-ya onye-iro nke Chineke. 5 Ma-ọbu ùnu nēchè na ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nēkwu okwu n'efu? Àgu ayi nāgusi Mọ ahu ike n'uzọ ekworo, bú Mọ Nke O mere ka O biri nime ayi? 6 Ma Ọ nēnye kari amara. N'ihi nka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ si, Chineke nēdo Onwe-ya imegide ndi-npako, ma Ọ nēnye ndi di ume-ala n'obi amara. 7 Ya mere donu onwe-unu n'okpuru Chineke; ma guzogidenu ekwesu, ọ gāb͕apu kwa n'ebe unu nọ. 8 Biarunu Chineke nso, Ọ gābiaru kwa unu nso. Menu ka aka-unu di ọcha, unu ndi-nmehie; me-kwa-nu ka obi-unu di ọcha, unu ndi nwere uche abua. 9 Hujunu anya, ru-kwa-nu újú, kwa-kwa-nu ákwá: ka ọchì-unu ghọ iru-újú, ka ọṅù-unu ghọ kwa nb͕aru-iru. 10 Wedanu onwe-unu n'iru Onye-nwe-ayi, Ọ gēweli kwa unu elu. 11 Umu-nnam, unu ekwutọritala ibe-unu. Onye nēkwutọ nwa-nna-ya, ma-ọbu nēkpe nwa-nna-ya ikpé, o nēkwutọ iwu, nēkpe kwa iwu ikpé: ma ọ buru na i nēkpe iwu ikpé, i bughi onye nēdebe iwu, kama i bu onye-ikpé-ya. 12 Nání otù Onye bu onye nēnye iwu, buru kwa onye-ikpé, bú Onye ahu Nke puru izọputa na ila ihe n'iyì: ma gì onwe-gi bu onye, gi onye nēkpe onye-ab͕ata-obi-gi ikpé? 13 Genu nti, unu ndi nāsi, Ta ma-ọbu echi ka ayi gāga obodo a, nọ kwa n'ebe ahu otù arọ, zu kwa ahia, rita kwa urù: 14 ma unu bu ndi nāmataghi ihe gēme echi. Ǹdu-unu bu gini? N'ihi na unu bu alulu, nke nāputa ìhè nwa oge, emesia ọ we pua n'anya. 15 Ma nke kwesiri unu ka unu kwue bu, Asi na Onye-nwe-ayi chọrọ, ayi gādi ndu, me kwa ihe a ma-ọbu ihe ahu. 16 Ma otú ọ di, unu nānya isi n'oké okwu-unu: inya-isi nile di otú a bu ajọ ihe. 17 Ya mere onye matara ime ihe ọma, ma ọ meghi ya, ọ buru onye ahu nmehie.

Jemes 5

1 Genu nti, unu ndi-ọgaranya, kwa ákwá, ti-kwa-nu nkpu n'ihi ihuju-anya nile unu nke nābiakwasi unu. 2 Àkù-unu erewo uré, uwe nile unu aghọwo kwa ihe nla ripiaworo. 3 Ọla-edo-unu na ọla-ọcha-unu ab͕awo nchara; nchara-ha gāburu kwa unu ihe-àmà, ọ gēripia kwa anu-aru-unu dika ọku. Unu kpadoro àkù-unu na mb͕e ikpe-azu. 4 Le, ugwọ-ọlu nke ndi-ọlu ndi bìri ọka n'ubi-unu, nke unu jidere na nmeb͕u, nēti nkpu: iti-nkpu nke ndi ahu ndi were ihe-ubi-unu abàwo na nti Onye-nwe usu nile nke ndi-agha. 5 Unu biri n'oké oriri na ọṅuṅu n'elu uwa, di kwa ndu ọjọ dika ọ nātọ aru-unu utọ; unu zùru obi-unu n'ubọchi ob͕ub͕u. 6 Unu mara ikpé, unu b͕uru onye ezi omume ahu; ọ dighi-edo onwe-ya imegide unu. 7 Ya mere, umu-nnam, nātachinu ogologo-ntachi-obi rue ọbibia nke Onye-nwe-ayi. Le, onye-ọlu-ubi nēche nkpuru di oké ọnu-ahia nke ala, nātachi ogologo-ntachi-obi n'ebe ọ di, rue mb͕e ọ gānata miri-ozuzo mbu na miri-ozuzo ikpe-azu. 8 Unu onwe-unu, nātachi-kwa-nu ogologo-ntachi-obi; menu ka obi-unu guzosie ike: n'ihi na ọbibia nke Onye-nwe-ayi di nso. 9 Umu-nnam, unu atamuritala megide onwe-unu, ka ewe ghara ikpe unu: le, Onye-ikpé-ayi nēguzo n'iru ọnu-uzọ. 10 Umu-nnam, natanu ndi-amuma ahu, bú ndi kwuru okwu n'aha Onye-nwe-ayi, dika ihe-ilere-anya nke ihuju-anya na nke ogologo-ntachi-obi. 11 Le, ayi nākpọ ha ndi ngọzi diri, bú ndi tachiri obi: unu nuru ihe bayere ntachi-obi nke Job, hu kwa ihe Onye-nwe-ayi zubere, na Onye-nwe-ayi bu onye nwere ọmiko ri nne, nwe kwa obi ebere. 12 Ma nke kachasi ihe nile, umu-nnam, unu aṅula iyí, unu ejila elu-igwe, ma-ọbu ala, ma-ọbu ihe iṅu-iyi ọ bula ọzọ, ṅu iyi: kama ka e-unu buru e, ka é-è-unu buru kwa é-è; ka unu we ghara idabà n'okpuru ikpé. 13 Ọ̀ di onye ọ bula n'etiti unu nāhuju anya? ya kpe ekpere. Ọ̀ di onye ọ bula nwere obi-utọ? ya bùa abù ọma. 14 Ọ̀ di onye ọ bula n'etiti unu nke aru-ya nādighi ike? ya kpọ ndi-okenye nke nzukọ Kraist ka ha biakute ya; ka ha kpe kwa ekpere n'isi-ya, nēte ya manu olive n'aha Onye-nwe-ayi: 15 ekpere nke okwukwe ahu gāzọputa kwa onye ahu aru nādighi ike, Onye-nwe-ayi gēme kwa ka o bilie; ọ buru kwa na o mehieworo, agāb͕aghara ya nmehie ahu. 16 Ya mere, nēkwuputanu nmehie nile unu gwarita ibe-unu, nēkpe kwa ekpere n'ihi ibe-unu, ka ewe me ka aru di unu ike. Aririọ nke onye ezi omume di ike nke-uku n'ilusi-ọlu-ike-ya. 17 Elaija bu madu yiri ayi n'aru-ya, o we kpesie ekpere ike ka miri ghara izo; miri ezoghi kwa n'ala arọ atọ na ọnwa isi. 18 O we kpe ekpere ọzọ; elu-igwe we nye miri-ozuzo, ala we mia nkpuru-ya. 19 Umu-nnam, asi na onye ọ bula n'etiti unu si n'ezi-okwu jehie, ma otù onye we me ka o chigharia; 20 ka ọ mara na onye meworo ka onye-nmehie si na njehie nke uzọ-ya chigharia gazọputa nkpuru-obi n'ọnwu, o gēkpuchi kwa ọtutu nmehie.

1 Pita 1

1 Pita, onye-ozi nke Jisus Kraist, nēdegara unu akwukwọ, bú ndi arọputaworo ndi bi dika ọbìa n'etiti Nb͕asa ahu nime Pọntọs, Galetia, Kapadọsia, Esia, na Bitinia, 2 ndi arọputaworo dika ọmuma-ihe Chineke buru uzọ mara si di, nime ido-nsọ nke Mọ Nsọ, ka unu we ṅa Jisus Kraist nti, ka ewe fesa kwa unu ọbara-Ya: Ka eme ka amara bara unu uba, ya na udo. 3 Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, Onye muru ayi ọzọ, dika oké ebere-Ya si di, ka ayi we nwe olile-anya di ndu, site na nbilite ahu nke Jisus Kraist si na ndi mwuru anwu bilite, 4 ka ayi we keta nketa nke anāpughi imebi, nke anādighi-emeru kwa emeru, nke nādighi-atalata kwa, nke edebeworo n'elu-igwe nye unu, 5 ndi ewere ike nke Chineke nēche nche site n'okwukwe rue nzọputa nke edoziworo ikpughe n'oge ikpe-azu. 6 Nke obi nātọ unu utọ nke-uku nime ya, ọ bu ezie na emere ka o wuta unu n'ọnwunwa di iche iche nwa oge ub͕u a, ma asi na ọ di nkpà, 7 ka nnwaputa nke okwukwe-unu, ebe ọ dikariri ọla-edo oké ọnu-ahia nke-uku, bú ọla-edo nke nāla n'iyì, ọ bu ezie na anēji ọku nwaputa ya, ka ewe hu nnwaputa ahu na ọ nēweta otuto na ebube na nsọpuru nime nkpughe nke Jisus Kraist: 8 Onye unu huru n'anya, ọ bu ezie na unu ahughi Ya anya; Onye unu kwere na Ya, ọ bu ezie na unu adighi-ahu Ya anya ub͕u a, obi we nātọ unu utọ nke-uku n'ọṅù nke anāpughi ikwu okwu nke enyewo-kwa-ra ya otuto: 9 ebe unu nānata ihe okwukwe-unu gēweta, bú nzọputa nke nkpuru-obi-unu. 10 Ọ bu kwa nzọputa nka ka ndi-amuma chọrọ, nyocha kwa ihe bayere ya, bú ndi buru amuma bayere amara ahu nke gēru unu: 11 nēnyocha oge ọ bu ma-ọbu aha oge ọ bu, bú nke Mọ nke Kraist Nke si nime ha nēgosi, mb͕e O buru uzọ nāb͕a àmà bayere ahuhu nke Kraist, na ebube nile nke gēso ha. 12 Ndi ekpughere nye, na ọ bughi onwe-ha, kama ọ bu unu, ka ha ji ihe ndia jere ozi, bú ihe nke akọrọ unu ub͕u a site n'ọnu ndi ahu ndi zìri unu ozi ọma nka nime Mọ Nsọ eziputara n'elu-igwe; ihe ọ nāgu ndi-mọ-ozi inyocha ha. 13 N'ihi nka kenu ihe-ọkiké a n'úkwù nke uche-unu, nwe-kwa-nu anya-udo, lezu-kwa-nu anya okè n'amara nke anēwetara unu nime nkpughe nke Jisus Kraist; 14 dika umu nke iṅa-nti, unu eme-kwa-la onwe-unu ka unu di ka agu ihe ọjọ ahu si di, bú nke guru unu na mbu n'amaghi-ihe-unu: 15 kama dika Onye kpọrọ unu di nsọ, unu onwe-unu, ghọ-kwa-nu ndi di nsọ n'ibi-obi nile di iche iche; 16 n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Unu gādi nsọ; n'ihi na nsọ ka Mu onwem di. 17 Ọ buru kwa na unu akpọku Ya dika Nna, bú Onye nēkpe ikpé dika ọlu madu nile n'otù n'otù si di nēleghi madu anya n'iru, nēbinu obi n'egwu n'oge unu bi dika ọbìa: 18 ebe unu matara na ejighi ihe apuru imebi, bú ọla-ọcha ma-ọbu ọla-edo, b͕aputa unu n'ibi-obi efu unu nke nna-unu-hà nyere unu n'aka ibi; 19 kama eji ọbara di oké ọnu-ahia, dika nke nwa-aturu nke ọlu ma-ọbu ntupọ nādighi ya n'aru, bú ọbara nke Kraist: 20 Onye eburu uzọ mara n'ezie mb͕e akātọghi ntọ-ala nke uwa, ma emere ka Ọ puta ìhè n'ọgwugwu oge ndia n'ihi unu, 21 ndi sitere n'aka-Ya buru ndi kwere na Chineke, Onye mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, we nye Ya ebube; ka okwukwe-unu na olile-anya-unu we di n'ebe Chineke nọ. 22 Ebe unu meworo nkpuru-obi-unu ka ha di ọcha n'iṅa-nti nke unu ṅara ezi-okwu, iwere ihu-n'anya nke iru-abua nādighi ya hu umu-nna-unu n'anya, sitenu n'obi-unu hurita onwe-unu n'anya si-ike: 23 ebe amuworo unu ọzọ, esiteghi na nkpuru apuru imebi, kama esitere na nke anāpughi imebi, site n'okwu Chineke, nke di ndu, nke nādigide kwa, mu unu ọzọ. 24 N'ihi na, Anu-aru nile di ka ahihia, Ebube-ya nile di kwa ka uzari ahihia. Ahihia akpọnwuwo, uzari-ya adapuwo kwa: 25 Ma okwu Onye-nwe-ayi nādigide rue mb͕e ebighi-ebi. Nka bu kwa okwu nke ozi ọma ahu ezisara unu.

1 Pita 2

1 Ya mere, tupunu ihe ọjọ nile, na aghughọ nile, na iru-abua, na ekworo, na nkwutọ nile di iche iche, 2 dika umu amuru ọhu, ka agu miri-ara nke okwu Chineke, nke aghughọ nādighi ya, nāgusi unu ike, ka unu we were ya nētó etó rue nzọputa; 3 ọ buru na unu deturu n'ire na Onye-nwe-ayi bu onye nwere obi-ọma; 4 Onye unu nābiakute, bú nkume di ndu, Nke madu juru n'ezie, ma n'ebe Chineke nọ Ọ bu ihe arọputara, buru kwa ihe anāsọpuru, 5 ewe were kwa unu onwe-unu, dika nkume di ndu, wu, ka unu buru ulo nke Mọ Nsọ, ka unu we buru òtù ndi-nchu-àjà di nsọ, ichu àjà nke di ka Mọ Nsọ si cho, nke di Chineke ezi nma site na Jisus Kraist. 6 N'ihi na ekwuru n'ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, si, Le, anamatọb͕ọ na Zaion otù isi nkume nime nkuku ntọ-ala, nke bu ihe arọputara, buru kwa ihe anāsọpuru: Onye kwe-kwa-ra na Ya, agaghi-eme ka ihere me ya ma-ọli. 7 Ya mere ọ bu unu, bú ndi kwere ekwe, ka nsọpuru ahu diri: ma n'ebe ndi nādighi-ekwe nọ, Nkume nke ndi nēwu ulo juru, Nke ahu ka emere isi nkuku ulo; 8 na, Nkume isu-ngọngọ, na oké nkume nke ima-n'ọnyà; n'ihi na ha nāsu ngọngọ n'okwu ahu, ebe ha nēkweyeghi ekweye: edo-kwa-ra ha ka ha me ihe a. 9 Ma unu onwe-unu bu ọb͕ọ ndi arọputaworo, òtù ndi-nchu-àjà ndi bu kwa eze, mba di nsọ, ndi nke Chineke nwetara, ka unu we kwusa idi-nma nile nke Onye ahu Onye kpọputara unu n'ọchichiri ahu ba n'ìhè-Ya di ebube: 10 ndi nābughi ndi n'oge gara aga, ma ub͕u a unu bu ndi nke Chineke: ndi anēmereghri ebere, ma ub͕u a unu bu ndi emeworo ebere. 11 Ndi m'huru n'anya, ariọm unu dika ndi-ọbìa na ndi nọ dika ọbìa, ka unu ghara ime ihe ọjọ di iche iche nāgu anu-aru, nke bu ihe nēbu agha imegide nkpuru-obi; 12 nēbinu obi-unu nke-ọma n'etiti ndi mba ọzọ; ka ha we site n'ọlu ọma nile unu, nke ha nēle anya, nye Chineke otuto n'ubọchi nleta ahu nime ihe ahu ha nēkwutọ unu nime ya dika ndi nēme ihe ọjọ. 13 Donu onwe-unu n'okpuru ibu-isi ọ bula madu debere n'ihi Onye-nwe-ayi; ma ọ bu eze, dika onye nọ n'ike n'elu unu; 14 ma-ọbu ndi-isi, dika ndi anēzite site n'aka-ya ka ha bọ̀ ọ́bọ̀ n'aru ndi nēme ihe ọjọ, ka ha to kwa ndi nēme ezi ihe. 15 N'ihi na otú a ka ọchichọ nke Chineke si di, ka unu site n'ime ezi ihe me ka amaghi-ihe nke ndi nēnweghi uche kpuchie ọnu: 16 dika ndi nwere onwe-ha, ma unu enweghi inwe-onwe-unu ahu dika ihe-nkpuchi nke ihe ọjọ, kama dika ndi-orù nke Chineke. 17 Sọpurunu madu nile. Hunu òtù ndi bu umu-nna n'anya. Nātunu egwu Chineke. Nāsọpurunu eze-unu. 18 Ndi nēje ozi, nēdonu onwe-unu n'okpuru ndi-nwe-unu n'egwu nile; ọ bughi nání n'okpuru ndi bu ezi madu ndi nwe-kwa-ra obi-ọma, kama ọ bu kwa n'okpuru ndi b͕agọrọ ab͕agọ. 19 N'ihi na nka bu ihe-ekele, ma ọ buru na onye ọ bula nātachi obi n'ihe-nwuta di iche iche n'ihi akọ-na-uche n'ebe Chineke nọ, nāhu ahuhu nke nēzighi ezi. 20 N'ihi na àha otuto gini di ya, ma ọ buru na, mb͕e unu nēmehie, mb͕e eti kwa unu aka, unu atachi obi na ya? 21 N'ihi na akpọrọ unu ime nka: n'ihi na Kraist hu-kwa-ra ahuhu n'ihi unu, nārapuru unu ihe ilere anya, ka unu we so ije-ukwu-Ya nile: 22 Onye ọ dighi nmehie ọ bula O mere, ahughi kwa aghughọ n'ọnu-Ya: 23 Onye, mb͕e anēkwuto Ya, Ọ dighi-ekwutọghachi ọzọ; mb͕e Ọ nāhu ahuhu, Ọ dighi-aba nba; kama Ọ rara Onwe-ya nye n'aka Onye ahu Nke nēkpe ikpé ziri ezi: 24 Onye Ya onwe-ya, dika àjà achuru, būru nmehie nile ayi n'aru-Ya n'elu osisi ahu, ka ayi, ebe ayi nwuworo n'ebe nmehie nile di, ka ayi we di ndu n'ebe ezi omume di; Onye eji ọnyá-utari-Ya me ka unu nwe ezi ndu. 25 N'ihi na unu nēhieri dika aturu; ma ub͕u a unu chigharikutere Onye ahu Onye nāzù nkpuru-obi-unu dika anāzù aturu, Onye nēlekọta kwa ha anya.

1 Pita 3

1 Otú ahu, ndi bu nwunye, nēdonu onwe-unu n'okpuru di nke aka unu; ka, ọbuná asi na ufọdu ekweyeghi okwu Chineke, ka ewe site n'ibi-obi nwunye-ha rita ha n'urù n'ebe anēkwughi okwu; 2 mb͕e ha nēle ibi-obi-unu di ọcha, ya na egwu. 3 Ndi ichọ-nma-ha ka ọ ghara ibu ichọ-nma ahu nke aru nke bu ikpa isi, na iyikwasi ihe ọla-edo, ma-ọbu iyikwasi ọtutu uwe; 4 kama ka ọ buru madu zoro ezo nke nkpuru-obi, n'uwe anāpughi imebi nke bu mọ di nwayọ di kwa udo, nke di oké ọnu-ahia n'anya Chineke. 5 N'ihi na otú a ka ndinyom ahu ndi di nsọ, ndi nēle anya Chineke, nāchọ kwa onwe-ha nma n'oge gara aga, nēdo onwe-ha n'okpuru di nke aka ha: 6 dika Sera ṅara Abraham nti, nākpọ ya onye-nwe-ya: onye emere unu ka unu buru umu-ya, ma ọ buru na unu eme ezi ihe, ghara kwa itu egwu site n'ujọ ọ bula. 7 Ndi bu di, otú ahu, sonu nwunye-unu bikọ n'uzọ ihe-omuma, nēkeye ihe bu nwanyi nsọpuru, dika onye nādighi ike kari, dika unu na ha bu kwa ndi nēketakọ amara nke bu ndu; ka ewe ghara ib͕ochi ekpere-unu. 8 Ma n'ikpe-azu, nwekọnu otù uche, unu nile, werenu obi sorita onwe-unu hukọ ahuhu, burunu ndi nāhu umu-nna-unu n'anya, ndi nwere obi ọmiko, ndi nwere uche di ume-ala: 9 ndi nādighi-ewere ihe ọjọ nyeghachi n'ọnọdu ihe ọjọ, ma-ọbu nkwutọ n'ọnọdu nkwutọ; ma kama nke ahu burunu ndi nāgọzi; n'ihi na ihe eji kpọ unu bu nka, ka unu we keta ngọzi. 10 N'ihi na, Onye ahu nke nāchọ ihu ndu n'anya, Na ihu ezi ubọchi, Ya me ka ire-ya ghara ikwu ihe ọjọ, Me kwa ka eb͕ub͕ere-ọnu-ya ghara ikwu okwu aghughọ: 11 Ya si kwa n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya, me ezi ihe; Ya chọ udo, b͕aso kwa ya. 12 N'ihi na anya abua nke Onye-nwe-ayi di n'aru ndi ezi omume, Nti-Ya abua di kwa n'ebe aririọ-ha di: Ma iru nke Onye-nwe-ayi digidere ndi nēme ihe ọjọ. 13 Ọ̀nye bu kwa onye ahu nke gēmejọ unu, ma o buru na unu ghọro ndi nānu ọku n'obi n'iso ezi ihe? 14 Ma ọ buru kwa na unu ahu ahuhu n'ihi ezi omume, ngọzi nādiri unu: ma unu atula egwu ahu ha nākpata, obi alọ-kwa-la unu miri; 15 kama donu Kraist-ayi nsọ nime obi-unu dika Onye-nwe-unu: buru-kwa-nu ndi edoziworo mb͕e dum igọpuru onye ọ bula nke nāju unu ajuju bayere olile-anya ahu nke di nime unu, ma ka unu were nwayọ na egwu gọpu: 16 ebe unu nwere ezi akọ-na-uche; ka ewe me ka ihere me ha, bú ndi nākpali ibi-obi ọma unu nime Kraist, nime ihe ahu nke anēkwutọ unu nime ya. 17 N'ihi na ọ ka nma, ma ọ buru na ọchichọ Chineke chọrọ ya, ka unu hu ahuhu n'ihi na unu nēme ezi ihe kama n'ihi na unu nēme ihe ọjọ. 18 N'ihi na Kraist hu-kwa-ra ahuhu bayere nmehie, nání otù mb͕e, Onye ezi omume n'ihi ndi ajọ omume, ka O we kuru ayi biakute Chineke; n'ihi na emere ka Ọ nwua anwu n'anu-aru-Ya, ma emere ka Ọ di ndu na mọ-Ya; 19 nke ọ bu kwa nime ya ka Ọ gara we kwusara ndi-mọ nọ n'ulọ-nkpọrọ okwu, 20 ndi nēkweyeghi n'oge gara aga, mb͕e ogologo-ntachi-obi Chineke nēchesi ike n'ubọchi Noa, mb͕e anēdozi ub͕o, nke ewere miri zọputa madu ole-na-ole, ya bu madu asatọ, nime ya: 21 bú miri nke nāzọputa kwa unu ub͕u a n'uzọ yiri ihe-atù a, ya bu baptism, ọ bughi itupu inyi nke aru, kama ọ bu ajuju nke ezi akọ-na-uche n'ebe Chineke nọ, site na nbilite-n'ọnwu nke Jisus Kraist; 22 Onye nọ n'aka-nri nke Chineke, ebe Ọ gara ba n'elu-igwe; edowo kwa ndi-mọ-ozi na ndi nāchi isi na ndi di ike n'okpuru Ya.

1 Pita 4

1 Ya mere, ebe Kraist huru ahuhu n'anu-aru, unu onwe-unu were kwa otù izù ahu ke dika ekike-agha; n'ihi na onye huworo ahuhu n'anu-aru agharawo nmehie; 2 ka unu we ghara ibi ọzọ n'oge fọduru unu n'anu-aru-unu ime ihe ọjọ di iche iche nāgu madu, kama ime ihe Chineke nāchọ. 3 N'ihi na oge nke gasiworo ezuwo iluputa ihe ndi mba ọzọ nēzube, na ijeghari nime agu ikwa-iko, agu ihe ọjọ nile, manya-ob͕ub͕u nile, ite-egwú nile, iṅubiga-manya-ókè nile, na ikpere-arusi nile jọb͕uru onwe-ha: 4 nke ha nēchè na ọ bu ihe madu nāhughi mb͕e ọ bula na unu adighi-eso ha n'omume ahu b͕abà n'otù njubiga-ókè ahu nke ndu ila-n'iyì, ha nēkwulu unu: 5 ndi gāza ajuju bayere onwe-ha nye Onye ahu Nke doziworo Onwe-ya ikpe ndi di ndu na ndi nwuru anwu ikpé. 6 N'ihi na ihe eji zìsara ọbuná ndi nwuru anwu ozi ọma bu nka, ka ewe kpe ha ikpé dika esi ekpe madu n'anu-aru, ma ka ha we di ndu dika Chineke si di na mọ. 7 Ma ọgwugwu ihe nile di nsọ: ya mere nwenu uche zuru okè, nwe-kwa-nu anya-udo ka unu we kpe ekpere: 8 nke bu isi ihe nile menu ka ihu-n'anya ahu unu nāhurita onwe-unu di ike; n'ihi na ihu-n'anya nēkpuchi ọtutu nmehie: 9 nelērita onwe-unu ọbìa nke-ọma nātamughi ntamu: 10 dika unu nile n'otù n'otù natara onyinye-amara, werenu ihe ahu nējerita onwe-unu ozi, dika ndi nāchi èzi-na-ulo nke-ọma n'amara Chineke nke di n'uzọ di iche iche; 11 ọ buru na onye ọ bula nēkwu okwu, ya kwue dika okwu nke si Chineke n'ọnu puta; ọ buru na onye ọ bula nēje ozi, ya je dika o sitere n'ike ahu Chineke nēnyezu: ka ewe nye Chineke otuto n'ihe nile site n'aka Jisus Kraist, Onye nwe ebube nile na ike nile rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen. 12 Ndi m'huru n'anya, unu echèla èchichè bayere ọnwunwa ọku ahu nke di n'etiti unu, nke nābiakwasi unu inwa unu, na ọ bu ihe anāhughi mb͕e ọ bula, dika agāsi na ọ bu ihe anāhughi mb͕e ọ bula nādakwasi unu: 13 kama ebe unu nwekọrọ ahuhu nke Kraist, nāṅurinu ọṅu; ka unu we were kwa obi nātọ utọ nke-uku ṅuria nime nkpughe nke ebube-Ya. 14 Ọ buru na anāta unu uta n'aha Kraist, ngọzi nādiri unu; n'ihi na Mọ nke ebube na Mọ nke Chineke nānọgide n'aru unu. 15 N'ihi na, ka onye ọ bula n'etiti unu ghara ihu ahuhu dika ob͕u-madu, ma-ọbu onye-ori, ma-ọbu onye nēme ihe ọjọ, ma-ọbu dika onye nēle ihe nābughi nke aka ya anya: 16 ma ọ buru na onye ọ bula nāhu ahuhu dika Kristian, ka ihere ghara ime ya; ma ka o nye Chineke otuto n'aha nka. 17 N'ihi na oge ahu eruwo ka esite n'ulo Chineke malite ikpe ikpé: ma ọ buru na o buru uzọ site n'aru ayi malite, gini gābu ọgwugwu nke ndi nēkweyeghi ozi ọma nke Chineke? 18 Ọ buru kwa na ọ di ike izọputa onye ezi omume, òle ebe agēgosi onye nādighi-asọpuru Chineke na onye-nmhie? 19 Ya mere ka ndi nāhu ahuhu dika ọchichọ Chineke si di were kwa nkpuru-obi-ha n'ime ezi ihe nye n'aka Onye-òkìkè kwesiri ntukwasi-obi idebe.

1 Pita 5

1 Ya mere, ariọm ndi-okenye nọ n'etiti unu, onye mu onwem bu okenye-ibe-unu, ya na onye-àmà nke ahuhu nile nke Kraist, abukwam onye-nnwekọ nke ebube ahu nke agaje ikpughe: 2 Nāzùnu ìgwè aturu ntà Chineke nke di n'etiti unu, nēlekọta ha anya, ọ bughi n'ihi na nkpà nākpa unu, kama site n'ọchichọ obi, dika Chineke chọrọ; ọ bughi kwa n'ihi urù nēweta ihere, kama n'ihi na unu di ọku n'obi; 3 ọ bughi kwa dika agāsi na unu nēme ndi bu ihe-nketa dika unu bu ndi-nwe-ha, kama nēme onwe-unu ihe-atù ìgwè aturu ntà ahu gēṅomi. 4 Mb͕e agēme kwa ka Onye-isi-ọzùzù-aturu puta ìhè, unu gānata okpu-eze nke ebube ahu, nke nādighi-atalata. 5 Otú ahu, unu ndi bu nwata, donu onwe-unu n'okpuru ndi-okenye. Ma unu nile were obi di ume-ala ke onwe-unu dika ákwà, ijerita ibe-unu ozi: n'ihi na Chineke nēdo Onwe-ya imegide ndi-npako, ma Ọ nēnye ndi di ume-ala n'obi amara. 6 Ya mere wedanu onwe-unu n'okpuru aka di ike nke Chineke, ka O we welie unu elu n'oge nke Ya; 7 nātukwasinu Ya ncheb͕u nile unu nēcheb͕u onwe-unu, n'ihi na ihe nile bayere unu nēmetu Ya n'obi. 8 Nwenu anya-udo, nēchenu nche: onye ahu nke nēkuru unu ga ikpé, bú ekwensu, dika ọdum nāb͕ọ uja, ọ nējeghari, nāchọ onye o gēlomi: 9 ma nēguzogidenu ya, n'ihi na unu di ike n'okwukwe-unu, ebe unu matara na anēmezu otù ahuhu ahu n'aru ndi bu òtù umu-nna-unu ndi nọ n'uwa. 10 Ma Chineke nke amara nile, Onye kpọbatara unu n'ebube ebighi-ebi Ya nime Kraist, mb͕e unu huworo ahuhu nwa oge, Ya onwe-ya gēme ka unu zue okè, me kwa ka unu guzosie ike, me kwa ka unu di ike, tọ kwa unu ntọ-ala. 11 Ọ bu Ya nwe ike nile rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen. 12 Site n'aka Silvanọs, nwa-nna-ayi kwesiri ntukwasi-obi, dika m'nāgu ya, ka m'nēdegara unu akwukwọ n'okwu ole-na-ole, nāriọ unu, nāb͕a kwa àmà na nka bu amara Chineke n'ezie: nēguzosinu ike nime ya. 13 Nwanyi ahu nke nọ na Babilon, nke soro unu buru onye arọputaworo, nēkele unu; nwam, bú Mak, nēkele kwa unu. 14 Werenu isutu-ọnu nke ihu-n'anya nēkelerita onwe-unu. Udo diri unu nile ndi nọ nime Kraist.

2 Pita 1

1 Saimon Pita, orù na onye-ozi nke Jisus Kraist, nēdegara unu akwukwọ, bú ndi ketaworo okwukwe di oké ọnu-ahia ra ka nke ayi ketaworo n'ezi omume Onye ahu, bú Chineke-ayi na Onye-nzọputa-ayi, Jisus Kraist; 2 Ka eme ka amara bara unu uba, ya na udo, nime nmazu nke Chineke na nke Jisus Onye-nwe-ayi; 3 dika ike O ji buru Chineke nyeworo n'aka-ayi ihe nile di ndu na nsọpuru-Chineke n'efu, site na nmazu nke Onye ahu Onye ji ebube na idi-nma nke aka Ya kpọ ayi; 4 bú nke O siteworo nye n'aka-ayi nkwa nile ahu di oké ọnu-ahia di kwa uku ri nne; ka unu we site n'ihe ndia ghọ ndi nēnwekọ ihe O ji buru Chineke, ebe unu b͕anariworo nmebi nke di n'uwa site n'agu ihe ọjọ. 5 Ma n'ihi otù ihe a n'akuku-unu tukwasinu inu-ọku-n'obi nile, nyezu-kwa-nu idi-nma n'okwukwe-unu; nyezu kwa ihe-ọmuma n'idi-nma-unu; 6 nyezu kwa ijisi-onwe-unu-ike n'ihe-ọmuma-unu; nyezu kwa ntachi-obi n'ijisi-onwe-unu-ike; nyezu kwa nsọpuru-Chineke nime ntachi-obi-unu; 7 nyezu kwa ihuunanya umu-nna nime nsọpuru-Chineke-unu; nyezu kwa ihu-n'anya nime ihu-n'anya-umu-nna-unu. 8 N'ihi na asi na unu nwere ihe ndia, asi kwa na unu nwere ha ri nne, ha nēdo unu ndi nābughi ndi nādighi-alu ọlu ma-ọbu ndi nādighi-ami nkpuru rue imazu Onye-nwe-ayi Jisus Kraist. 9 N'ihi na onye ahu ihe ndia nādighi ya nso bu onye kpuru ìsì, onye nāhu inyoghi-inyoghi, ebe ọ chezọrọ nsachapu nke nmehie ochie ya nile. 10 N'ihi nka, umu-nnam, nānunu ọku n'obi kari ime ka ọkpukpọ-unu na nrọputa-unu buru ihe nēguzosi ike: n'ihi na asi na unu e#me ihe ndia, unu agaghi-asu ngọngọ mb͕e ọ bula ma-oli: 11 n'ihi na otú a ka agēnyezu unu n'àkù nbata ahu unu gābata nime ala-eze ebighi-ebi nke Onye-nwe-ayi, bú Onye-nzọputa-ayi, Jisus Kraist. 12 N'ihi nka mb͕e dum agajem ichetara unu ihe ndia, ọ bu ezie na unu matara ha, emewo kwa ka unu guzosie ike n'ezi-okwu ahu nke dinyere unu. 13 Ma anamagu ya n'ihe ziri ezi, ka oge ra m'nọ n'ulo-ikwū a, ikpali unu n'ichetara unu; 14 ebe m'matara na ntupu nke ulo-ikwūm nka nābia ọsọsọ, ọbuná dika Onye-nwe-ayi Jisus Kraist gosirim. 15 E, m'gānu ọku n'obi ka unu we nwe ike icheta ihe ndia n'oge nile ọ bula mb͕e m'lasiri. 16 N'ihi na ayi esoghi akukọ-irò nke eji amam-ihe kọ, mb͕e ayi mere ka unu mara ike na ọbibia nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ma emere ayi ka ayi buru ndi huru idi-uku nke Onye ahu. 17 N'ihi na Ọ natara nsọpuru na ebube n'aka Chineke, bú Nna, mb͕e Ebube ahu nke kwesiri idi-uku mere ka olu di otú a dara Ya, si, Onye a bu Ọkparam M'huru n'anya, Onye ihe-Ya di Mu onwem ezi nma: 18 olu a ka ayi onwe-ayi nukwara ka o nēsi n'elu-igwe da, mb͕e ayi na Ya nọ n'ugwu ahu di nsọ. 19 Eme-kwa-ra ka okwu amuma ahu guzosiere ayi ike kari; nke unu nēme nke-ọma n'iṅa nti ya, dika oriọna mb͕e ọ nēnwu n'ebe b͕ara ọchichiri, rue mb͕e chi gābọ, kpakpando chi-ọbubọ we tibe n'obi-unu: 20 ebe unu buru uzọ mara nka, na ọ dighi amuma ọ bula n'ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nke madu puru ikọ isi-ya site na nání uche nke aka ya. 21 N'ihi na ọ dighi amuma ọ bula nke eji ọchichọ madu bu mb͕e ọ bula: kama madu sitere na Chineke kwue okwu, mb͕e Mọ Nsọ nēme ka ha kwue.

2 Pita 2

1 Ma ndi-amuma ugha putakwara ìhè n'etiti ndi Israel, dika ndi-ozizí ugha gādi kwa n'etiti unu, bú madu ndi gēwere nzuzo webata irọ-òtù di iche iche nke ila-n'iyì, nāgọnari ọbuná Onye-nwe-ha Onye b͕ara ha, ndi nēweta ila-n'iyì di ngwa tukwasi onwe-ha n'isi. 2 Ọtutu madu gēso kwa uzọ agu-ikwa-iko-ha; ndi agēkwulu uzọ nke ezi-okwu n'ihi ha. 3 Nime anya-uku ka ha gēji kwa okwu nrafu di iche iche were unu zua ahia: ndi ọmuma-ikpe-ha nābughi ihe nādighi-alu ọlu site n'oge ochie, ila-n'iyì-ha adighi-atu kwa ura. 4 N'ihi na asi na Chineke emereghi ndi-mọ-ozi ebere mb͕e ha mehiere, kama Ọ tubàra ha n'ime-ime ọku ala-mọ, we rara ha nye n'olùlù nke ọchichiri, ka ewe debe ha ikpe ikpé; 5 asi kwa na O mereghi uwa ochie ebere, kama ọ bu Noa, onye mere ha asatọ, bú onye nēkwusa ezi omume, ka O chere, mb͕e O mere ka iju-miri biakwasi uwa nke ndi nādighi-asọpuru Chineke; 6 O we me ka obodo Sọdọm na Gọmọrra ghọ ntu, were kwa ikpù-iru ma ha ikpé, ebe O mere ha-ri ka ha buru ihe-ilere-anya nye ndi gaje ibu ndi nādighi-asọpuru Chineke; 7 O we dọputa Lot, bú onye ezi omume, mb͕e ibi-obi n'agu ikwa-iko nke ndi ahu ndi nēmebi iwu nēwuta ya nke-uku 8 (n'ihi na onye ezi omume ahu, ebe o nēbi n'etiti ha, o were ọlu-ha nke nēmebi iwu mekpa nkpuru-obi ezi omume ya aru kwa-ubọchi, n'ile ihe na inu ihe): 9 Onye-nwe-ayi matara idọputa ha n'ọnwunwa, bú ndi nāsọpuru Chineke, na idebe ndi ajọ omume n'ahuhu-nmehie rue ubọchi ikpé; 10 ma nke kachasi ndi nējeso anu-aru n'agu ihe emeruru emeru, ndi nēlelì kwa ibu-onye-nwe-madu anya. Ndi nwere anya-ike, ndi nwere isi-ike, ha amaghi aru jijiji ikwulu ndi nọ n'ebube: 11 ebe ndi-mọ-ozi, ọ bu ezie na ha ka ha n'ume na ike, ma ha ekpegideghi ha ikpé nkwulu n'iru Onye-nwe-ayi. 12 Ma ndia, dika anu nēnweghi uche, ndi bu anu nzuzu site n'ọmumu-ha inwude na imebi, nēkwulu Chineke n'ihe ha nāmaghi, agēmebi kwa ndia na nmehie ha, 13 ndi anēmejọ ha dika ugwọ-ọlu nke ajọ omume; madu ndi nāgu ya n'ihe-utọ, bú ibi n'oké oriri na oké ọṅuṅu n'ehihie, ndi bu ntupọ na ihe-ita-uta, nānọ n'oké oriri na oké ọṅuṅu n'oriri ihu-n'anya ha mb͕e ha nēso unu rikọ ihe; 14 ha bu ndi nwere anya nke juputara n'aru nwanyi nākwa iko, anya nke nāpughi kwa ighara imehie; ha bu kwa ndi nārafu nkpuru-obi ndi nādighi-eguzosi ike; ha nwekwara obi anwaputaworo n'anya-uku; buru kwa umu nke ọbubu-ọnu; 15 ha rapuru uzọ guzosiri ike eguzo, we jehie, ebe ha soro uzọ Belam nwa nke Beoa, onye huru ugwọ-ọlu nke ajọ omume n'anya; 16 ma aturu ya nmebi iwu nke aka ya n'anya: inyinya-ibu nke dara ob͕i were olu madu kwu okwu we b͕ochie anya-adighi-nma nke onye-amuma ahu. 17 Ndia bu isi-iyi nke miri nādighi, buru kwa alulu nke oké ifufe nēfepu; ndi edebeworo ha itiri nke ọchichiri. 18 N'ihi na, ebe ha nēkwu oké okwu na mbuli elu nke ihe-efu, ha were agu ikwa-iko di iche iche nārafu ndi ahu nime agu ihe ọjọ nke anu-aru, bú ndi nāb͕anari n'oge ub͕u a ndi nēbi obi na njehie; 19 ha nēkwe kwa ha nkwa na ha gēnwe onwe-ha, ọ bu ezie na ha onwe-ha bu orù nke nmehie; n'ihi na ihe meriworo madu, ihe a ka emewo-kwa-ra ka onye ahu buru orù-ya. 20 N'ihi na asi na, mb͕e ha b͕anariworo ihe nile emeruru emeru nke uwa site na nmazu nke Onye-nwe-ayi, bú Onye-nzọputa-ayi, Jisus Kraist, ewe nime ihe ndia, meri kwa ha, ọnọdu ikpe-azu ha abiawo jọkari ọnọdu mbu njọ. 21 N'ihi na ọ gākawori nma ma ọ buru na ha akāmazughi uzọ ezi omume, kari imazu ya, we si n'ihe di nsọ ahu enyere n'iwu, nke enyere ha n'aka idebe, laghachi. 22 Okwu nke ezi ilu ahu adakwasiwo ha, Ọ bu nkita nke chighariri ọzọ n'ihe ọ b͕ọrọ, buru kwa nne-ezì nke chighariri ọzọ n'ituru n'apiti mb͕e ọ sachasiri onwe-ya.

2 Pita 3

1 Ndi m'huru n'anya, nka bu akwukwọ-ozi nke-abua nke m'nēdegara unu ub͕u a; ma nime ha abua ka m'nakpali uche-unu di ọcha n'ichetara unu; 2 ka unu we cheta okwu nke ndi-amuma di nsọ buru uzọ kwu, cheta kwa ihe ahu Onye-nwe-ayi, bú Onye-nzọputa-ayi, nyere n'iwu site n'ọnu ndi-ozi-unu: 3 ebe unu buru uzọ mara nka, na ndi-ọchìe gēji ichì-ọchì bia na mb͕e ikpe-azu, nāga dika agu ihe ọjọ nke aka ha si di, 4 nāsi kwa, Òle ebe nkwa nke ọbibia-Ya di? n'ihi na site n'ubọchi nna-ayi-hà dara n'ura ọnwu, ihe nile nādigide dika ha diworo site na nmalite nke òkìkè. 5 N'ihi na nka mere ha nchefu n'ihi na ha nāchọ ya, na elu-igwe di site na mb͕e ochie, ha na ala nke esitere na miri were kwa miri me ka o guzokọ n'otù, site n'okwu Chineke; 6 nke esitere n'aka-ha me ka uwa nke di n'oge ahu la n'iyì, n'ihi na iju-miri rikpuru ya: 7 ma elu-igwe nke di ub͕u a, ha na uwa, ka akpadoworo nye ọku site n'otù okwu ahu, ebe anēdebe ha nye ubọchi nke ikpé na ila-n'iyì nke ndi nādighi-asọpuru Chineke. 8 Ma unu ekwela ka otù ihe a me unu nchefu, ndi m'huru n'anya, na otù ubọchi di ka nnù arọ abua na ọgu iri n'anya Onye-nwe-ayi, nnù arọ abua na ọgu iri di kwa ka otù ubọchi. 9 Onye-nwe-ayi anọghi ọdù n'ime nkwa-Ya, dika ufọdu nāgu ya na ọ bu inọ-ọdù; kama Ọ nātachiri unu ogologo-ntachi-obi, n'ihi na O zubeghi ka ndi ọ bula la n'iyì, kama ka madu nile bia rue nchèghari. 10 Ma ubọchi Onye-nwe-ayi gābia dika onye-ori; nke ọ bu nime ya ka elu-igwe gēji oké ùzù gabiga, ihe nile di n'elu-igwe gāb͕a kwa ọku we la n'iyì, uwa na ọlu nile aluru nime ya gērechapu kwa. 11 Ebe anēme ka ihe ndia nile la n'iyì otú a, ọ̀ bu aha madu gini ka unu nāghaghi ibu n'ibi-obi nsọ nile na nsọpuru-Chineke nile, 12 nēle anya ọbibia nke ubọchi ahu nke Chineke, nēme kwa ka ọ bia ngwa ngwa, nke elu-igwe gēre ọku we la n'iyì n'ihi ya, ihe nile di n'elu-igwe gāb͕a kwa ọku we b͕aze? 13 Ma dika nkwa-Ya si di, ayi nēle anya elu-igwe ọhu na uwa ọhu, nke ezi omume bi nime ha. 14 N'ihi nka, ndi m'huru n'anya, ebe unu nēle anya ihe ndia, nānunu ọku n'obi ka ewe hu unu n'udo, ndi nēnweghi ntupọ, ndi anāpughi kwa ita uta n'iru Ya. 15 Nāgu-kwa-nu ogologo-ntachi-obi Onye-nwe-ayi na ọ bu nzọputa; dika nwa-nna-ayi ayi huru n'anya, bú Pọl, dega-kwa-ra unu n'akwukwọ, dika amam-ihe enyere ya si di; 16 dika ọ de-kwa-ra n'akwukwọ-ozi-ya nile; nēkwu okwu bayere ihe ndia nime ha; nke ihe ufọdu nke di ike ighọta di nime ha, nke ndi anēzíghi ihe na ndi nādighi-eguzosi ike nāchighari, dika ha nēme kwa ihe fọduru nke edeworo n'akwukwọ nsọ, ila onwe-ha n'iyì. 17 Ya mere, unu onwe-unu, ndi m'huru n'anya, ebe unu buru uzọ mara ihe ndia, nēchenu onwe-unu nche, ka aghara iwere njehie nke ndi nēmebi iwu bupu unu, unu we si na nguzosi-ike nke aka unu dapu. 18 Ma nābanu uba n'amara na ọmuma nke Onye-nwe-ayi, bú Onye-nzọputa-ayi, Jisus Kraist. Ọ bu Ya ka otuto diri ma ub͕u a ma rue ubọchi nke mb͕e ebighi-ebi. Amen.

2 Jọn 1

1 Ihe nke diri site na mbu, ihe ayi nuworo, ihe ayi jiworo anya-ayi hu, ihe ayi kiriri, nke aka-ayi datukwara, bayere Okwu nke ndu ahu, 2 (emekwara ka ndu ahu puta ìhè, ayi ahuwo kwa ya, nāb͕a kwa àmà, kọ-kwa-ra unu ndu ahu, ndu nke diri n'ebe Nna ayi nọ, ewe me ka ọ putara ayi ìhè); 3 ọ bu ihe ayi huworo, nu kwa, ka ayi nākọkwara unu, ka unu onwe-unu we so kwa ayi nwekọ ya: ma nnwekọ-ayi bu kwa nke ayi soro Nna-ayi, so kwa Ọkpara-Ya Jisus Kraist, nēnwekọ: 4 ihe ndia ka ayi onwe-ayi nēde kwa n'akwukwọ, ka ewe mezue ọṅù-ayi. 5 Nka bu kwa ozi ahu nke ayi nuworo n'ọnu-Ya, nākọ-kwa-ra unu, na Chineke bu ìhè, ọ dighi kwa ọchichiri ọ bula di nime Ya. 6 Ọ buru na ayi asi na ayi nēso Ya nwekọ ihe, ma ayi nējeghari n'ọchichiri, ayi nēkwu okwu-ugha, ayi adighi-eme kwa ezi-okwu: 7 ma ọ buru na ayi ejegharia n'ìhè ahu, dika Ya onwe-ya nọ n'ìhè ahu, ayi nēnwekọrita ihe n'etiti onwe-ayi, ọbara Jisus, bú Ọkpara-Ya, nāsachapu kwa ayi nmehie nile. 8 Ọ buru na ayi asi na ayi enweghi nmehie, ayi nēduhie onwe-ayi, ezi-okwu ahu adighi kwa nime ayi. 9 Ọ buru na ayi ekwuputa nmehie-ayi, Ọ bu Onye kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa Onye ezi omume, ka O we b͕aghara ayi nmehie-ayi, sachapu kwa ayi ajọ omume nile. 10 Ọ buru na ayi asi na ọ dighi mb͕e ọ bula ayi mehiere, ayi nēme Ya onye-ugha, okwu-Ya adighi kwa nime ayi.

2 Jọn 2

1 Umu-ntakirim, ihe ndia ka m'nēdegara unu n'akwukwọ, ka unu we ghara imehie. Ọ buru kwa na onye ọ bula emehie, ayi nwere otù Onye nēkwu ọnu ayi n'ebe Nna-ayi nọ, Ya bu Jisus Kraist, bú Onye ezi omume: 2 Ya onwe-ya bu kwa ihe ijuru Chineke obi bayere nmehie nile ayi; ma Ọ bughi ihe ijuru Ya obi bayere nání nmehie nke ayi onwe-ayi, kama Ọ bu kwa ihe ijuru Ya obi bayere nmehie nke uwa dum; 3 nime nka ka ayi ma-kwa-ra na ayi amawo Ya, ma ọ buru na ayi edebe ihe nile O nyere n'iwu. 4 Onye, nāsi, Amawom Ya, ma ọ dighi-edebe ihe nile O nyere n'iwu, ọ bu onye-ugha, ezi-okwu adighi kwa nime onye ahu: 5 ma onye ọ bula nke nēdebe okwu-Ya, ọ bu nime onye ahu ka emeworo ka ihunanya Chineke zue okè n'ezie. Nime nka ka ayi mara na ayi nọ nime Ya: 6 onye nāsi na ọ nānọgide nime Ya, o ji ugwọ ka ya onwe-ya nējeghari kwa dika Ya onwe-ya jeghariri. 7 Ndi m'huru n'anya, ọ dighi ihe ọhuu enyere n'iwu nkem m'nēdegara unu, kama ihe ochie enyere n'iwu nke unu nwere site na mbu: ihe ochie ahu enyere n'iwu bu okwu ahu nke unu nuru. 8 Ọzọ, ihe ọhu enyere n'iwu ka m'nēdegara unu, ya bu ihe nke bu ezi-okwu nime Ya na nime unu; n'ihi na ọchichiri ahu nāgabiga, ezi ìhè ahu nāmu kwa ub͕u a. 9 Onye nāsi na ya nọ n'ìhè ahu, ma ọ nākpọ nwa-nna-ya asì, ọ nānọ n'ọchichiri ahu rue ub͕u a. 10 Onye nāhu nwa-nna-ya n'anya nānọgide n'ìhè ahu, ọ dighi ihe nēme ka madu ma n'onyà di nime ya. 11 Ma onye nākpọ nwa-nna-ya asì nọ n'ọchichiri ahu, nējeghari kwa nime ọchichiri ahu, ọ mataghi kwa ebe ọ nāga, n'ihi na ọchichiri ahu mere ka anya-ya kpue ìsì. 12 Umu-ntakirim, anamedegara unu akwukwọ, n'ihi na agbagharawo unu nmehie-unu n'ihi aha-Ya. 13 Ndi bu nna, anamedegara unu akwukwọ, n'ihi na unu amawo Onye ahu Nke di site na mbu. Umu-okorọbia, anamedegara unu akwukwọ, n'ihi na unu emeriwo ajọ onye ahu. Umu-ntakirim, edegaram unu akwukwọ, n'ihi na unu amawo Nna-ayi. 14 Ndi bu nna, edegaram unu akwukwọ, n'ihi na unu amawo Onye ahu nke di site na mbu. Umu-okorọbia, edegaram unu akwukwọ, n'ihi na unu di ike, okwu Chineke nānọgide kwa nime unu, unu emeriwo kwa ajọ onye ahu. 15 Unu ahula uwa, ma-ọbu ihe nke di n'uwa, n'anya. Ọ buru na onye ọ bula ahú uwa n'anya, ihu-n'anya nke Nna-ayi adighi nime ya. 16 N'ihi na ihe nile nke di n'uwa, bú agu ihe ọjọ nke anu-aru, na agu ihe ọjọ nke anya, na oké-okwu nke ibi-obi, esiteghi na Nna-ayi, kama o sitere n'uwa. 17 Uwa nāgabiga kwa, ya na agu ihe ọjọ ya: ma onye nēme ihe Chineke nāchọ nānọgide rue mb͕e ebighi-ebi. 18 Umu-ntakirim, ọ bu oge hour ikpe-azu: dika unu nukwara na otù onye nke nēmegide Kraist nābia, ọbuná ub͕u a ọtutu ndi nēmegide Kraist aputawo; nke ayi sitere na ya mara na ọ bu oge hour ikpe-azu. 19 Ha siri n'etiti ayi pua, ma ha abughi ndi nke ayi; n'ihi na asi na ha bu ndi nke ayi, ha gānọgidewori n'etiti ayi: ma ha puru, ka ewe me ka ha puta ìhè na ha nile bu ndi nābughi ndi nke ayi. 20 Unu onwe-unu nwe-kwa-ra otite-manu site n'Onye Nsọ ahu, unu mata-kwa-ra ihe nile. 21 Ọ bughi n'ihi na unu amataghi ezi okwu ahu ka m'degara unu akwukwọ, kama ọ bu n'ihi na unu matara ya, ọ bu kwa n'ihi na ọ dighi ugha ọ bula si n'ezi-okwu ahu puta. 22 Onye bu onye-ugha ahu ma-ọbughi onye nāgọ si na Jisus abughi Kraist ahu? Onye nāgọnari Nna-ayi na Ọkpara-Ya, onye a bu onye ahu nēmegide Kraist. 23 Onye ọ bula nke nāgọnari Ọkpara ahu, o nweghi kwa Nna ahu: onye nēkwuputa Ọkpara ahu, o nwe-kwa-ra Nna ahu. 24 Ma unu onwe-unu, ka ihe ahu unu nuru site na mbu digide nime unu. Ọ buru na ihe ahu unu nuru site na mbu adigide nime unu, unu onwe-unu gānọgide kwa nime Ọkpara ahu, nọgide kwa nime Nna-Ya. 25 Nka bu kwa nkwa ahu nke Ya onwe-ya kwere ayi, bú ndu ahu, nke bu ndu ebighi-ebi. 26 Ihe ndia ka m'degara unu n'akwukwọ bayere ndi nēduhie unu. 27 Unu onwe-unu kwa, otite-manu ahu nke unu natara n'aka-Ya nādigide nime unu, ọ dighi kwa unu nkpà ka onye ọ bula zí unu ihe; kama dika otite-manu-Ya nēzí unu ihe bayere ihe nile, dika ọ bu kwa ezie, nābughi kwa okwu-ugha, dika O zíkwara unu, nānọgidenu nime Ya. 28 Umu-ntakirim, nānọgide-kwa-nu nime Ya ub͕u a; ka ọ gābu, ma ọ buru na agēme ka Ọ puta ìhè, ka ayi we nwe nkwuwa-okwu, ghara kwa iwere ihere pua n'iru Ya n'ọbibia-Ya. 29 Ọ buru na unu matara na Ọ bu onye ezi omume, unu mara na onye ọ bula nke nēme ezi omume bu kwa onye amuworo site na Ya.

2 Jọn 3

1 Lenu aha ihunanya nka bu nke Nna-ayi nyeworo ayi, ka ewe kpọ ayi umu Chineke: ayi bu kwa umu-Ya. N'ihi nka uwa amaghi ayi, n'ihi na ọ maghi Ya. 2 Ndi m'huru n'anya, ub͕u a ka ayi bu umu Chineke, akēmeghi kwa ka ọ puta ìhè ihe ayi gābu. Ayi matara na, ọ buru na agēme ka Ọ puta ìhè, ayi gābu ndi yiri Ya; n'ihi na ayi gāhu Ya otú Ọ di. 3 Onye ọ bula nke nwere olile-anya nka n'ebe Ọ nọ, ọ nēme kwa onwe-ya ka ọ di ọcha, dika Ya onwe-ya di ọcha. 4 Onye ọ bula nke nēme nmehie, ọ nēme kwa ihe nmebi iwu: nmehie bu kwa nmehie-iwu. 5 Unu mata-kwa-ra na emere ka Ya onwe-ya puta ìhè ka O we hichapu nmehie; nmehie adighi kwa nime Ya. 6 Onye ọ bula nke nānọgide nime Ya adighi-emehie: onye ọ bula nke nēmehie ahughi Ya anya mb͕e ọ bula, ọ maghi kwa Ya. 7 Umu-ntakirim, unu ekwela ka onye ọ bula duhie unu: onye nēme ezi omume bu onye ezi omume, dika Ya onwe-ya bu onye ezi omume: 8 onye nēme nmehie si n'ekwensu puta; n'ihi na ekwensu nēmehie site na mbu. Ihe eji me ka Ọkpara Chineke puta ìhè bu nka, ka O we la ọlu nile nke ekwensu n'iyì. 9 Onye ọ bula nke amuworo site na Chineke adighi-eme nmehie, n'ihi na nkpuru-Ya nādigide nime ya: ọ pughi kwa imehie, n'ihi na amuwo ya site na Chineke. 10 Nime nka ka umu Chineke bu ndi emeworo ka ha puta ìhè, ha na umu ekwensu: onye ọ bula nke nādighi-eme ezi omume esighi na Chineke puta, onye nke nādighi-ahu nwa-nna-ya n'anya esighi kwa na Ya puta. 11 N'ihi na nka bu ozi ahu unu nuru site na mbu, ka ayi hurita onwe-ayi n'anya: 12 ọ bughi dika Ken si buru onye si n'ajọ onye ahu puta, we b͕ue nwa-nne-ya. Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka o b͕uru ya? N'ihi na ọlu-ya jọrọ njọ, ma ọlu nke nwa-nne-ya ziri ezi. 13 Umu-nnam, ka ọ ghara iju unu anya ma ọ buru na uwa akpọ unu asì. 14 Ayi onwe-ayi matara na ayi esitewo n'ọnwu ba na ndu, n'ihi na ayi nāhu umu-nna-ayi n'anya. Onye nādighi-ahu n'anya nānọgide n'ọnwu. 15 Onye ọ bula nke nākpọ nwa-nna-ya asì bu ob͕u-madu: unu mata-kwa-ra na ọ dighi ob͕u-madu ọ bula nwere ndu ebighi-ebi nādigide nime ya. 16 Nime nka ka ayi maworo ihu-n'anya, n'ihi na Ya onwe-ya tọb͕ọrọ ndu-Ya n'ihi ayi: ayi onwe-ayi ji kwa ugwọ itọb͕ọ ndu-ayi n'ihi umu-nna-ayi. 17 Ma onye ọ bula nke nwere ihe uwa nka o ji biri, nke hu-kwa-ra nwa-nna-ya ka ọ nọ na nkpà, o we mechigide ya obi ebere ya, ìhunanya Chineke si aǹa digide nime ya? 18 Umu-ntakirim, ka ayi ghara ihu n'anya n'okwu, ma-ọbu n'ire; kama ka ayi nāhu n'anya n'ọlu na ezi-okwu. 19 Nime nka ka ayi gāmara na ayi bu ndi nke ezi-okwu ahu, me kwa ka obi-ayi kwenye ekwenye n'iru Ya, 20 n'ihe ọ bula nke obi-ayi nāma ayi ikpé nime ya; n'ihi na Chineke ka obi-ayi uku, Ọ ma-kwa-ra ihe nile. 21 Ndi m'huru n'anya, ọ buru na obi-ayi amaghi ayi ikpé, ayi nwere nkwuwa-okwu n'ebe Chineke nọ; 22 ihe ọ bula ayi nāriọ kwa, ayi nānata ya n'aka-Ya, n'ihi na ayi nēdebe ihe nile Ọ nyere n'iwu, ayi nēme kwa ihe nile nātọ utọ n'iru Ya. 23 Nka bu kwa ihe O nyere n'iwu, ka ayi kwere n'aha nke Ọkpara-Ya Jisus Kraist, hurita kwa onwe-ayi n'anya, dika O nyere ayi iwu. 24 Onye nēdebe kwa ihe nile O nyere n'iwu nānọgide nime Ya, Ya onwe-ya nānọgide kwa nime ya. Nime nka ka ayi makwara na Ọ nānọgide nime ayi, site na Mọ Nsọ ahu Nke O nyere ayi.

2 Jọn 4

1 Ndi m'huru n'anya, unu ekwela okwu mọ nile, kama nwaputanu udi-mọ ahu, ma ha bu ndi siri na Chineke puta: n'ihi na ọtutu ndi-amuma ugha apuwo ba n'uwa. 2 Nime nka ka unu mara Mọ nke Chineke: mọ ọ bula nke nēkwuputa na Jisus Kraist abiawo n'anu-aru bu mọ nke siri na Chineke puta: 3 ma mọ ọ bula nke nādighi-ekwuputa Jisus, o sighi na Chineke puta: nka bu kwa mọ nke onye ahu nēmegide Kraist, nke unu nuworo na ọ nābia; ọ bu kwa n'oge di ub͕u a ka ọ nọ n'uwa. 4 Umu-ntakirim, unu onwe-unu bu ndi siri na Chineke puta, unu emeriwo kwa ha: n'ihi na Onye ahu Nke nọ nime unu ka onye ahu nke nọ n'uwa uku. 5 Ndi ahu bu ndi nke uwa: n'ihi nka ha nēkwu okwu nke si n'uwa puta, uwa nānu kwa olu-ha. 6 Ayi onwe-ayi bu ndi siri na Chineke puta: onye mara Chineke nānu olu-ayi; onye nēsighi na Chineke puta adighi-anu olu-ayi. Ayi sitere na nka mara mọ ezi-okwu ahu, na mọ nduhie ahu. 7 Ndi m'huru n'anya, ka ayi hurita onwe-ayi n'anya: n'ihi na ihu-n'anya bu ihe si na Chineke puta; onye ọ bula nke nāhu n'anya bu kwa onye amuworo site na Chineke, ọ ma-kwa-ra Chineke. 8 Onye nādighi-ahu n'anya amaghi Chineke; n'ihi na Chineke bu ihu-n'anya. 9 Nime nka ka emere ka ihu-n'anya Chineke puta ìhè nime ayi, na Chineke ewerewo Ọkpara Ọ muru nání Ya zite n'uwa, ka ayi we di ndu site n'aka-Ya. 10 Nime nka ka ihu-n'anya di, ọ bughi na ayi onwe-ayi huru Chineke n'anya, kama ọ bu na Ya onwe-ya huru ayi n'anya, we zite Ọkpara-Ya ka Ọ buru ihe ijuru Ya obi bayere nmehie-ayi. 11 Ndi m'huru n'anya, ọ buru na Chineke huru ayi n'anya otú a, ayi onwe-ayi ji kwa ugwọ ihurita onwe-ayi n'anya. 12 Ọ dighi onye ọ bula huworo Chineke mb͕e ọ bula: ọ buru na ayi ahurita onwe-ayi n'anya, Chineke nānọgide nime ayi, emewo kwa ka ihu-n'anya-Ya zue okè nime ayi: 13 nime nka ka ayi mara na ayi nānọgide nime Ya, na Ya onwe-ya nānọgide kwa nime ayi, n'ihi na O nyewo ayi ufọdu nime Mọ nke Ya. 14 Ayi onwe-ayi ahuwo kwa, ayi nāb͕a kwa àmà, na Nna-ayi ezitewo Ọkpara-Ya ka Ọ buru Onye-nzọputa nke uwa. 15 Onye ọ bula nke gēkwuputa na Jisus bu Ọkpara Chineke, Chineke nānọgide nime ya, ya onwe-ya nānọgide kwa nime Chineke. 16 Ayi onwe-ayi amawo kwa ihu-n'anya ahu, ayi ekwerewo kwa na ya, bú nke Chineke nwere n'ebe ayi nọ. Chineke bu ihu-n'anya; onye nānọgide kwa n'ihu-n'anya; nime Chineke ka ọ nanọgide Chineke nānọgide kwa nime ya. 17 Nime nka ka emeworo ka ihu-n'anya zue okè n'akuku ayi, ka ayi we nwe nkwuwa-okwu n'ubọchi ikpé ahu; n'ihi na dika Ya onwe-ya di, ayi onwe-ayi di kwa otú a n'uwa nka. 18 Egwu adighi n'ihu-n'anya: kama ihu-n'anya nke zuru okè nāchupu egwu n'èzí, n'ihi na egwu, akēmeghi ya ka o zue òkè nime ihunanya 19 Ayi onwe-ayi nāhu n'anya, n'ihi na Ya onwe-ya buru uzọ hu ayi n'anya. 20 Ọ buru na onye ọ bula gāsi, Anamahu Chineke n'anya, ma ọ nākpọ nwa-nne-ya asì, ọ bu onye-ugha: n'ihi na onye nādighi-ahu nwa-nna-ya n'anya, bú onye ọ huworo, ọ pughi ihu Chineke n'anya, bú Onye ọ nāhughi mb͕e ọ bula. 21 Ihe a enyere n'iwu ka ayi nwe-kwa-ra site n'ebe Ọ nọ, ka onye nāhu Chineke n'anya, ka ọ hu kwa nwa-nna-ya n'anya.

2 Jọn 5

1 Onye ọ bula nke kwere na Jisus bu Kraist ahu, amuwo ya site na Chineke: ọzọ onye ọ bula nke nāhu Onye ahu Nke muru n'anya, ọ nāhu kwa onye ahu nke amuworo site na Ya n'anya. 2 Nime nka ka ayi mara na ayi nāhu umu Chineke n'anya, mb͕e ọ bula ayi nāhu Chineke n'anya, me kwa ihe nile O nyere n'iwu. 3 N'ihi na nka bu ihu-n'anya Chineke, ka ayi debe ihe nile O nyere n'iwu: ihe O nyere n'iwu adighi kwa arọ́. 4 N'ihi na ihe ọ bula nke amuworo site na Chineke nēmeri uwa: nka bu kwa nmeri nke meriworo uwa, bú okwukwe-ayi. 5 Ma ònye bu onye nēmeri uwa, ma-ọbughi onye ahu nke kwere na Jisus bu Ọkpara Chineke? 6 Nka bu Onye ahu Nke were miri na ọbara bia, bú Jisus Kraist; ọ bughi nání nime miri ahu, kama ọ bu nime miri ahu na nime ọbara ahu. 7 Ọ bu kwa Mọ Nsọ bu Onye nāb͕a àmà, n'ihi na Mọ ahu bu ezi-okwu. 8 N'ihi na ndi ahu ndi nāb͕a àmà di atọ, bú Mọ ahu, na miri ahu, na ọbara ahu: ha atọ diri ime otù ihe ahu. 9 Ọ buru na ayi anata àmà nke madu, àmà nke Chineke ka ya uku: n'ihi na àmà nke Chineke bu nka, na Ọ b͕awo àmà bayere Ọkpara-Ya. 10 Onye kwere n'Ọkpara Chineke nwere àmà ahu nime ya: onye nēkweghi okwu Chineke emewo Ya onye-ugha; n'ihi na o kweghi n'àmà ahu nke Chineke b͕aworo bayere Ọkpara-Ya. 11 Àmà ahu bu nka, na Chineke nyere ayi ndu ebighi-ebi, ndu ahu di nime Ọkpara-Ya. 12 Onye nwere Ọkpara ahu nwere ndu ahu; onye nēnweghi Ọkpara Chineke enweghi ndu ahu. 13 Ihe ndia ka m'degara unu n'akwukwọ, bú ndi kwere n'aha Ọkpara Chineke, ka unu we mata na unu nwere ndu ebighi-ebi. 14 Nkwuwa-okwu ahu nke ayi nwere n'ebe Ọ nọ bu nka, na ọ buru na ayi ariọ ihe ọ bula dika ọchichọ-Ya si di, Ọ nānu olu-ayi: 15 ọ buru kwa na ayi matara na Ọ nānu olu-ayi n'ihe ọ bula ayi nāriọ, ayi matara na ayi nwere ihe-aririọ ahu ayi riọ̀woro n'aka-Ya. 16 Ọ buru na onye ọ bula ahú nwa-nna-ya ka ọ nēmehie nmehie nke nādighi-eweta ọnwu, ọ gāriọ aririọ, Chineke gēnye kwa ya ndu inye ndi nēmehie nmehie ahu nke nādighi-eweta ọnwu. Nmehie di nke nēweta ọnwu: ọ bughi ekpere bayere nka ka m'nāgwa ya ka o kpe. 17 Ajọ omume nile bu nmehie: nmehie di kwa nke nādighi-eweta ọnwu. 18 Ayi matara na onye ọ bula nke amuworo site na Chineke adighi-emehie; kama Onye ahu Nke amuru Ya site na Chineke nēdebe ya, ajọ onye ahu adighi-emetu kwa ya aka. 19 Ayi matara na ayi bu ndi si na Chineke puta, uwa dum nātọb͕ọ kwa n'aka ajọ onye ahu. 20 Ma ayi matara na Ọkpara Chineke abiawo, nye kwa ayi uche, ka ayi we mara Onye-ezi-okwu ahu, ayi nọ kwa nime Onye-ezi-okwu ahu, nime Ọkpara-Ya, bú Jisus Kraist. Nka bu ezi Chineke, na ndu ebighi-ebi. 21 Umu-ntakirim, chenu onwe-unu nche ka unu ghara ikpere arusi.

2 Jọn 1

1 Okenye nēdegara nwanyi-nwe-madu, bú onye arọputaworo, akwukwọ, ya na umu-ya, ndi mu onwem nāhu n'anya n'ezi-okwu; ọ bughi kwa nání mu onwem, kama ọ bu kwa ndi nile ndi maworo ezi-okwu ahu; 2 n'ihi ezi-okwu ahu nke nānọgide nime ayi, ọ gādiye-kwa-ra ayi rue mb͕e ebighi-ebi: 3 Amara, ebere, udo gādiyere ayi site n'ebe Chineke, bú Nna-ayi, nọ, site kwa n'ebe Jisus Kraist nọ, bú Ọkpara nke Nna-ayi, nime ezi-okwu na ihu-n'anya. 4 Anamaṅuri ọṅu nke-uku na ahuwom ufọdu n'etiti umu-gi ka ha nējeghari nime ezi-okwu, dika ayi natara ihe enyere n'iwu n'aka Nna-ayi. 5 Anamariọ kwa gi ub͕u a, nwanyi-nwe-madu, ọ bughi dika agāsi na anamedegara gi ihe ọhu enyere n'iwu n'akwukwọ, kama ọ bu nke ayi nwere site na mbu, ka ayi hurita onwe-ayi n'anya. 6 Ihu-n'anya ahu bu kwa nka, ka ayi nējeghari dika ihe nile O nyere n'iwu si di. Ihe ahu enyere n'iwu bu nka, dika unu nuru site na mbu, ka unu nējeghari nime ya. 7 N'ihi na ọtutu ndi-nduhie apuwo ba nime uwa, bú ndi nādighi-ekwuputa na Jisus Kraist nābia n'anu-aru. Nka bu onye-nduhie ahu na onye ahu nēmegide Kraist. 8 Lezienu onwe-unu anya, ka unu we ghara ila ọlu ayi luru n'iyì, kama ka unu we nata ugwọ-ọlu zuru ezù. 9 Onye ọ bula nke nāga n'iru, nke nādighi-anọgide kwa nime ozizí nke Kraist-ayi, o nweghi Chineke: onye nānọgide nime ozizí ahu, onye ahu nwere Nna ahu, Ya na Ọkpara-Ya. 10 Ọ buru na onye ọ bula abiakute unu, ma ọ wetaghi ozizí a, unu akpọbatala ya n'ulo, unu asi-kwa-la ya biri nke-ọma: 11 n'ihi na onye nāsi ya biri nke-ọma nēso ya n'inwekọ ọlu-ya nile, nke bu ajọ ọlu. 12 Ebe m'nwere ọtutu ihe idegara unu n'akwukwọ, ezubeghm iwere akwukwọ na ink de ha: kama anamele anya na m'gābiaru unu aru, were kwa ọnu gwa unu okwu, ka ewe mezu ọṅù-unu. 13 Umu nwa-nna-gi nwanyi, bú onye arọputaworo, nēkele gi.

3 Jọn 1

1 Okenye nēdegara Gaiọs akwukwọ, bú onye ahuru n'anya, onye mu onwem nāhu n'anya n'ezi-okwu. 2 Onye m'huru n'anya, anamekpere Chineke ka ihe nile nāgara gi nke-ọma, ka i nwe kwa ezi ndu, dika ọ nāgara nkpuru-obi-gi nke-ọma. 3 N'ihi na aṅuririm ọṅu nke-uku, mb͕e umu-nna-ayi ufọdu biara we b͕a àmà ezi-okwu-gi, dika gi onwe-gi nējeghari n'ezi-okwu. 4 Enweghm ọṅù nke ka ihe ndia uku, bú inu ka umu nke akam nējeghari n'ezi-okwu ahu. 5 Onye m'huru n'anya, i nēme ihe kwesiri ntukwasi-obi n'ọlu ọ bula i luru n'ebe ndi bu umu-nna-ayi, ndi bu kwa ndi-ọbìa, nọ; 6 ndi b͕ara àmà ihu-n'anya-gi n'iru nzukọ Kraist: ndi i gēme nke-ọma idupu ha n'ije-ha dika o kwesiri imere Chineke: 7 n'ihi na ọ bu n'ihi Aha ahu ka ha puru, nānaraghi ihe ọ bula n'aka ndi mba ọzọ. 8 Ya mere ayi onwe-ayi ji ugwọ ikpọbata madu di otú a, ka ayi we buru kwa ndi soro ezi-okwu ahu nālukọ ọlu. 9 Edegaram nzukọ-unu ihe n'akwukwọ: ma Diọtrefis, onye ọ nātọ utọ ibu onye-isi n'etiti ha, anaraghi ayi nke-ọma. 10 N'ihi nka, ọ buru na abiam, m'gēme ka echeta ọlu-ya nile nke ọ nālu, n'iwere ajọ okwu nēkwugide ayi ihe-nzuzu: afọ ejughi kwa ya n'ihe ahu, ma ya onwe-ya adighi-anara umu-nna-ayi nke-ọma, ọ nēb͕ochi kwa ndi nēzube inara ha, ọ nāchupu kwa ha na nzukọ Kraist. 11 Onye m'huru n'anya, eṅomila ihe ọjọ, kama nēṅomi ezi ihe. Onye nēme ezi ihe bu onye siri na Chineke puta: onye nēme ihe ọjọ ahughi Chineke mb͕e ọ bula. 12 Madu nile, ha na ezi-okwu onwe-ya, ab͕aworo Dimitriọs àmà: e, ayi onwe-ya nāb͕a kwa àmà; i mata-kwa-ra na àmà-ayi bu ezie. 13 Enwerem ọtutu ihe idegara gi n'akwukwọ, ma achọghm iwere ink na pen degara gi: 14 ma anamele anya ihu gi ngwa ngwa, ayi gēwere kwa ọnu kwurita okwu. 15 Ka udo diri gi. Ndi-eyì-ayi nēkele gi. Nēkele ndi-eyì-ayi n'aha n'aha.

Jud 1

1 Judas, orù nke Jisus Kraist, na nwa-nne Jemes, nēdegara unu akwukwọ, bú ndi akpọworo, ndi ahuru n'anya nime Chineke, bú Nna-ayi, ndi edebewo kwara Jisus Kraist: 2 Ka eme ka ebere na udo na ihu-n'anya bara unu uba. 3 Ndi m'huru n'anya, ebe m'nānu ọku nile n'obi idegara unu akwukwọ bayere nzọputa ahu azọputakọrọ ayi, ọ dim nkpà idegara unu akwukwọ nāriọ unu ka unu nāb͕asi nb͕a ike n'ihi okwukwe ahu nke enyere ndi nsọ n'aka nání otù mb͕e idebe. 4 N'ihi na madu ufọdu b͕ebàra, bú ndi ewereworo ha gosi ọra madu mb͕e ochie ka ewe ma ha ikpé a, ndi nādighi-asọpuru Chineke, ndi nāgha amara Chineke-ayi ka ọ buru agu ikwa-iko, ndi nāgọnari kwa Onye nání Ya bu Nna-nwe-ọra, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist. 5 Ma anamezube ichetara unu, ọ bu ezie na unu matara ihe nile nání otù mb͕e, na Onye-nwe-ayi, mb͕e Ọ zọputarari otù ndi n'ala Ijipt, emesia O we la ndi nēkweghi ekwe n'iyì. 6 Ndi-mọ-ozi ndi nēdebeghi ibu-isi nke aka ha, kama ha rapuru ebe-obibi nke aka ha, O debewo kwa ha n'ab͕u ebighi-ebi n'okpuru ọchichiri nye ikpé nke oké ubọchi ahu. 7 Dika Sọdọm na Gọmọra, na obodo di ha gburugburu, ebe ha rara onwe-ha nye n'ikwa-iko n'uzọ di otú ndia mere, we pua so anu-aru di iche, edebewo ha n'iru ọra madu dika ihe-ngosi, nāhu ahuhu-nmehie nke ọmuma-ikpé ziri ezi, nke bu ọku ebighi-ebi. 8 Ma otú ahu madu ndia nēmeru kwa anu-aru-ha n'irọ-nrọ-ha, ju kwa ibu-onye-nwe-madu, kwulu kwa ndi nọ n'ebube. 9 Ma Maikael onye-isi-mọ-ozi, mb͕e ya na ekwensu nārurita uka banyere aru Moses, ka ọ nēkwugide ya, o nweghi anya-ike ikpe ya ikpé nkwulu, kama ọ siri, Ka Onye-nwe-ayi bara gi nba. 10 Ma ndia nēkwulu ihe nile, ka ha ra, bú ihe ha nāmatagh: ma ka ha ra, bú ihe ha nāghọta site n'ọmumu, dika anu nēnweghi uche, nime ihe ndia ka anēmebi ha. 11 Ahuhu gādiri ha, n'ihi na ha gara n'uzọ Ken, wusì kwa onwe-ha dika miri na njehie nke Belam n'ihi ugwọ-ọlu, we la n'iyì na nkwugide nke Kora. 12 Ndia bu ndi nke bu nkume zoro ezo n'oriri ihu n'anya unu mb͕e ha nēso unu rikọ ihe nātughi egwu, ndi nāzù onwe-ha dika aturu; ha bu igwe-oji nke miri nādighi, nke ifufe nēfeghari; buru kwa osisi nāmighi nkpuru n'oge nkpuru, nke nwuru anwu ub͕ò abua, nke eropuru eropu; 13 buru kwa ebili-miri di egwu nke oké osimiri, nāsuputa ihere nke aka ha dika ufufu; umu-kpakpando nējehie ejehie, ndi edebeworo itiri nke ọchichiri rue mb͕e ebighi-ebi. 14 Ọ bu kwa ndia ka Inok, bú onye-asa site n'Adam, buru amuma, si, Le, Onye-nwe-ayi biara Ya na ndi nsọ Ya, anāpughi iguta ọnu, 15 ikpe madu nile ikpé, na itu ndi nile ndi nāsọpurughi Chineke ihe n'anya, bú ọlu nile nke asọpughi-Chineke ha nke ha luru n'asọpughi-Chineke, ha na okwu di ike nile nke ndi-nmehie ndi nāsọpurughi Chineke kwugidere Ya. 16 Ndia bu ndi-ntamu, ndi nāta Chineke uta, nējeso agu ihe ọjọ nile ha (ọnu-ha nēkwu kwa oké okwu nāfuli afuli), ndi nāja iru madu n'ihi urù. 17 Ma unu onwe-unu, ndi m'huru n'anya, chetanu okwu nile nke ndi-ozi Onye-nwe-ayi Jisus Kraist buru uzọ kwu; 18 na ha siri unu, N'oge ikpe-azu ndi-ọchì gādi, nāga dika agu ihe ọjọ nile nke aka ha nke asọpughi-Chineke si di. 19 Ndia bu ndi nākpata nkewa, ndi nkpuru-obi madu nāchi, ndi nēnweghi Mọ Nsọ. 20 Ma unu onwe-unu, ndi m'huru n'anya, n'iwuli onwe-unu elu dika ulo n'elu okwukwe-unu dikarisiri nsọ, n'ikpe kwa ekpere nime Mọ Nsọ, 21 debe onwe-unu n'ihu-n'anya Chineke, nēche ebere Onye-nwe-ayi Jisus Kraist rue ndu ebighi-ebi. 22 Nēme-kwa-ranu ufọdu ebere, bú ndi nwere obi abua; 23 nāzọputa-kwa-nu ufọdu, nāguputa ha n'ọku; ma werenu egwu mere ufọdu ebere; nākpọ ọbuná uwe anu-aru nyeworo ntupọ asì. 24 Ma Onye ahu nke puru iche unu nche ka unu ghara isu ngọngọ, na iguzo unu n'iru ebube-Ya nādighi ita uta n'oké obi-utọ, 25 Onye nání Ya bu Chineke, buru kwa Onye-nzọputa-ayi, ka ha site n'aka Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi, diri Ya, bú otuto na idi-uku na ike na ichi-isi, mb͕e oge a nile akērughi, ub͕u a kwa, we ru kwa mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.

Nkpughe 1

1 Nkpughe nke Jisus Kraist, nke Chineke nyere Ya igosi ndi-orù-Ya, bú ihe nāghaghi iputa n'isi nso: O we site n'aka mọ-ozi-Ya ziga we gosi Jọn orù-Ya; 2 onye b͕ara àmà nke okwu Chineke, na nke àmà Jisus Kraist, ka ha ra, bú ihe ọ huru. 3 Ngọzi nādiri onye nāgu, na ndi nānu okwu nile nke amuma nka, ndi nēdebe kwa ihe nile edeworo nime ya: n'ihi na oge ahu di nso. 4 Jọn nēdegara nzukọ Kraist asa nke di n'Esia akwukwọ: Amara diri unu, ya na udo, nke si n'aka Onye ahu puta, bú Onye nādi adi, Onye dikwari, Onye nābia kwa; nke si kwa n'aka Mọ asa ahu puta, bú ndi nọ n'iru oche-eze-Ya; 5 nke si kwa n'aka Jisus Kraist puta, Onye bu onye-àmà kwesiri ntukwasi-obi, onye eburu uzọ mu n'etiti ndi nwuru anwu, buru kwa onye-isi nke ndi-eze uwa. Onye ahu Nke nāhu ayi n'anya, Onye tọpu-kwa-ra ayi na nmehie nile ayi nime ọbara-Ya; 6 O we me ka ayi buru ala-eze, ndi-nchu-àjà nye Chineke na Nna nke Ya; ọ bu Ya ka otuto nile na ike nile diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen. 7 Le, Ọ nābia, Ya na igwe-oji; anya nile ọ bula gāhuzu kwa Ya, ndi ahu gāhu kwa Ya, bú ndi mara Ya ube; ebo nile nke uwa gēti-kwa-ra ya aka n'obi. E, Amen. 8 Mu onwem bu Alfa ahu na Omega ahu, ka Onye-nwe-ayi Chineke kwuru, bú Onye nādi adi, Onye di-kwa-ri, Onye nābia kwa, Onye puru ime ihe nile. 9 Mu onwem, bú Jọn, nwa-nna-unu na onye nēso unu nwekọ nkpab͕u na ala-eze na ntachi-obi nke di nime Jisus, emere ka m'nọ n'agwe-etiti ahu nke anākpọ Patmọs, n'ihi okwu Chineke na àmà Jisus. 10 Emere ka m'nọ nime Mọ Nsọ n'ubọchi Onye-nwe-ayi, m'we nu otù oké olu n'azum, dika nke opì, 11 ka ọ nāsi, Ihe i nele anya, de ya n'akwukwọ, ziga-kwa-ra nzukọ Kraist asa ndia; zigara Efesọs, ziga-kwa-ra Smuana, ziga-kwa-ra Pagamọm, ziga-kwa-ra Taiataira, ziga-kwa-ra Sadis, ziga-kwa-ra Filadelfia, ziga-kwa-ra Leọdisia. 12 M'we chigharia ile olu ahu nke nākpayerem uka. Mb͕e m'chigharisiri m'we hu ihe-idọba-oriọna asa nke eji ọla-edo me; 13 n'etiti ihe-idọba-oriọna asa ahu ahu-kwa-ram otù Onye yiri nwa nke madu, Onye nēyi uwe nke ruru n'ukwu ala, ewerewo kwa ihe-ọkiké nke ọla-edo ke n'obi-Ya gburugburu. 14 Isi-Ya na agiri-isi-Ya di kwa ọcha dika aji-anu ọcha, dika snow; anya-Ya abua di kwa ka ire ọku; 15 ukwu-Ya abua di kwa ka ọla akwọchapuru ka o b͕upu, dika agāsi na erere ya-ri n'oké ọku; olu-Ya di kwa ka olu ọtutu miri. 16 O nwe-kwa-ra kpakpando asa n'aka-nri-Ya: mma-agha di nkọ nke nwere iru abua nēsi kwa n'ọnu-Ya puta: iru-Ya di kwa ka anyanwu nāmu n'ike-ya. 17 Mb͕e m'huru Ya, m'we da n'ala n'ukwu-Ya dika onye nwuru anwu. O we bikwasim aka-nri-Ya, si, Atula egwu; Mu onwem bu onye mbu na onye ikpe-azu, 18 buru kwa Onye ahu nādi ndu; aghọ-kwa-ram onye nwuru anwu, ma le, anamadi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi, enwe-kwa-ram nkpisi-ugodi nile nke ọnwu na nke Hedis 19 Ya mere, de ihe nile i huru n'akwukwọ, ha na ihe nke nādi adi, na ihe nile nke gaje iputa mb͕e ihe ndia gasiri; 20 ihe-omimi nke kpakpando asa ahu nke i huru n'aka-nrim, na ihe-idọba-oriọna asa ahu nke eji ọla-edo me. Kpakpando asa ahu bu ndi-mọ-ozi nke nzukọ Kraist asa ahu: ihe-idọba-oriọna asa ahu bu kwa nzukọ Kraist asa.

Nkpughe 2

1 Degara mọ-ozi nke nzukọ Kraist di n'Efesọs akwukwọ, si, Ihe ndia ka Ọ nēkwu, bú Onye nēji kpakpando asa ahu n'aka-nri-Ya, Onye nējeghari n'etiti ihe-idọba-oriọna asa ahu nke eji ọla-edo me: 2 Amataram ọlu-gi nile, na ndọb͕u i nādọb͕u onwe-gi n'ọlu, na ntachi-obi-gi, mata kwa na i pughi inagide ndi ọjọ, i nwa-kwa-ra ndi nākpọ onwe-ha ndi-ozi, ma ha abughi, i we hu na ha bu ndi-ugha; 3 i nwe-kwa-ra ntachi-obi, i bū-kwa-ra ibu n'ihi aham, ike akāgwughi kwa gi. 4 Ma enwerem nka imegide gi, na i rapuru ihu-n'anya ahu i nwere na mbu. 5 Ya mere cheta ebe i siworo dapu, gi chèghari kwa, lu kwa ọlu mbu; ma asi na i meghi otú a anamabiakute gi, M'gēwepu kwa ihe-idọba-oriọna-gi n'ọnọdu-ya, ma asi na i chègharighi. 6 Otú ọ di, nka ka i nwere, na i nākpọ ọlu nile nke ndi-Nikọlaitan asì, bú nke Mu onwem nākpọ kwa asì. 7 Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist. Onye nēmeri emeri, ya ka M'gēkweye ka o rie nkpuru si n'osisi nke ndu ahu puta, bú nke di na Paradais nke Chineke. 8 Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Smuana akwukwọ, si, Ihe ndia ka Ọ nēkwu, bú Onye ahu nke bu onye mbu na onye ikpe-azu, Onye ghọrọ onye nwuru anwu, we dikwa ndu: 9 Amataram nkpab͕u-gi, na ob͕eye i bu (ma i bu ọgaranya), na nkwulu Chineke nke ndi nāsi na ha bu ndi-Ju, ma ha abughi, kama ha bu ulo-nzukọ Setan. 10 Atula ahuhu nile i gaje ihu egwu: le, ekwensu gaje itubà ufọdu n'etiti unu nime ulo-nkpọrọ, ka ewe nwa unu; unu gēnwe kwa nkpab͕u ubọchi iri. Gosi onwe-gi onye kwesiri ntukwasi-obi rue ọnwu, M'gēnye kwa gi okpu-eze ahu, bú ndu. 11 Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist. Onye nēmeri emeri, agaghi-emejọ ya site n'ọnwu nke-abua ahu. 12 Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Pagamọm akwukwọ, si, Ihe ndi ka O nēkwu, bú Onye ahu Nke nwere mma-agha di nkọ ahu nke nwere iru abua: 13 Amataram ebe i bi, bú ebe oche-eze Setan di: i nējidesi kwa aham ike, i gọnarighi kwa okwukwem, ọbuná n'ubọchi Antipas onye-àmàm, onye nkem kwesiri ntukwasi-obi, onye eb͕uru n'etiti unu, ebe Setan bi. 14 Ma enwerem ihe ole-na-ole imegide gi, n'ihi na i nwere n'ebe ahu ufọdu ndi nējidesi ozizí Belam ike, bú onye nēzí Belak itọb͕ọ n'iru umu Israel ihe-ima-n'ọnyà, ka ha rie ihe achuru n'àjà nye arusi, ka ha kwa kwa iko. 15 Otú a, gi onwe-gi nwe-kwa-ra ufọdu ndi nējidesi ozizí ndi-Nikọlaitan ike otú ahu. 16 Ya mere, chègharia; ma asi na i meghi otú a anamabiakute gi ọsọsọ, M'gēwere kwa mma-agha nke ọnum bu agha megide ha. 17 Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist. Onye nēmeri emeri, ya ka M'gēnye ufọdu nime manna ahu nke ezobeworo, M'gēnye kwa ya nkume ọcha, n'elu nkume ahu ka edewo-kwa-ra aha ọhu, nke ọ nādighi onye ọ bula matara ma-ọbughi onye nānata ya. 18 Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Taiataira akwukwọ, si, Ihe ndia ka Ọkpara Chineke nēkwu, Onye anya-Ya abua di ka ire ọku, ukwu-Ya abua di kwa ka ọla akwọchapuru ka o b͕upu: 19 Amataram ọlu-gi nile, na ihu-n'anya-gi na okwukwe-gi na ije-ozi-gi na ntachi-obi-gi, mata kwa na ọlu ikpe-azu gi kariri nke-mbu. 20 Ma enwerem nka imegide gi, na i kwere nwanyi ahu, bú Jezebel, onye nākpọ onwe-ya onye-amuma-nwanyi; o nēzí kwa ndi-orùm ihe, nēduhie kwa ha, ka ha kwa iko, ri kwa ihe achuru n'àjà nye arusi. 21 Enye-kwa-ram ya oge, ka o we chègharia; ma ọ chọghi ichèghari n'ikwa-iko-ya. 22 Le, anamatubà ya n'ihe-nkpab͕u, tubà kwa ndi soro ya kwa iko nime oké nkpab͕u, ma asi na ha echègharighi n'ọlu-ya. 23 M'gēwere kwa ọnwu b͕ue umu-ya; nzukọ Kraist nile gāmara kwa na Mu onwem bu onye nēnyocha akuru na obi nile: M'gēnye kwa unu n'otù n'otù dika ọlu nile unu si di. 24 Ma unu ka m'nāgwa, bú ndi fọduru na Taiataira, ka unu ra, bú ndi nēnweghi ozizí a, madu ndi nāmaghi ihe nile di omimi nke Setan, dika ha nēkwu; ebokwasighi m unu ibu arọ́ ọzọ. 25 Otú ọ di, ihe unu nwere, jidesienu ya ike rue mb͕e M'gābia. 26 Onye nēmeri emeri, na onye nēdebe ọlum nile rue ọgwugwu ihe nile, ya ka M'gēnye kwa ike ichi mba nile: 27 ọ gewere kwa nkpa-n'aka ígwè zùa ha dika aturu, dika anākujisi ite nke ọkpu-ite; dika Mu onwem natawokwara n'aka Nnam: 28 M'gēnye kwa ya kpakpando ututu. 29 Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist.

Nkpughe 3

1 Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Sadis akwukwọ, si, Ihe ndia ka Ọ nēkwu, bú Onye nwere Mọ asa ahu nke Chineke, na kpakpando asa ahu: Amataram, ọlu-gi nile, na i nwere aha na i di ndu, ma i bu onye nwuru anwu. 2 Ghọ onye nēche nche, me kwa ka ihe fọduru guzosie ike, bú nke gaje inwu anwu: n'ihi na ọ dighi ọlu-gi M'huworo nke zuworo ezù n'iru Chinekem. 3 Ya mere, nēcheta otú i nataworo, ya na otú i nuru; nēdebe kwa ya, chèghari kwa. Ya mere, asi na i cheghi nche, M'gābia dika onye-ori, i gaghi-amara kwa oge hour M'gābiakwasi gi ma-ọli. 4 Ma i nwere aha ole-na-ole na Sadis ndi nēmerughi uwe-ha: ha gēsokam nējeghari nime uwe ọcha; n'ihi na ha bu ndi kwesiri. 5 Onye nēmeri emeri ka agēb͕okwasi uwe ọcha otú a; M'gaghi-ehichapu kwa aha-ya nime akwukwọ nke ndu nkem ma-ọli, M'gēkwuputa kwa aha-ya n'iru Nnam, na n'iru ndi-mọ-ozi-Ya. 6 Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist. 7 Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Filadelfia akwukwọ, si, Ihe ndia ka Ọ nēkwu, bú Onye di Nsọ, Onye-ezi-okwu, Onye nwere nkpisi-ugodi nke Devid, Onye nēmeghe, ọ dighi kwa onye ọ bula gēmechi, Onye nēmechi kwa, ọ dighi kwa onye ọ bula nēmeghe: 8 Amataram ọlu-gi nile (le, enyewom gi ọnu-uzọ nke emegheworo n'iru gi, nke onye ọ bula nāpughi imechi), na i nwere ike ntà, i debe-kwa-ra okwum, i gọnarighi kwa aham. 9 Le, anamenye ufọdu nime ulo-nzukọ, ahu nke Setan, nime ndi si na ha bu ndi-Ju, ma ha abughi, kama ha nēkwu okwu-ugha; le, M'gēme ka ha bia kpọ isi ala n'iru ukwu-gi, ka ha mara kwa na Mu onwem huru gi n'anya. 10 N'ihi na i debere okwu nke ntachi-obim, Mu onwem gēdebe kwa gi ka i ghara ibà n'oge hour nke ọnwunwa ahu, bú oge hour nke gaje ibiakwasi elu-uwa dum madu bi, inwa ndi bi n'elu uwa. 11 Anamabia ọsọsọ: jidesie ihe i nwere ike, ka onye ọ bula ghara inara ọkpu-eze-gi. 12 Onye nēmeri emeri, ya ka M'gēme ka ọ buru ide n'ulo nsọ nke Chinekem, ọ gaghi-esi kwa n'ebe ahu pua ọzọ ma-ọli: M'gēde-kwasi kwa ya aha Chinekem, na aha obodo Chinekem, bú Jerusalem ọhu, nke si n'elu-igwe ridata site n'ebe Chinekem nọ, M'gēdekwasi kwa ya aha ọhu nkem. 13 Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist. 14 Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Leọdisia akwukwọ, si, Ihe ndia ka Amen ahu nēkwu, bú Onye-àmà ahu Nke kwesiri ntukwasi-obi, Nke bu kwa Onye-ezi-okwu, Isi nke ihe nile Chineke kère: 15 Amataram ọlu-gi nile, na i jughi oyi i kpoghi kwa ọku: ọ gādi m nọ̄ nma ma i nāju oyi ma-ọbu na i nēkpo ọku. 16 Otú a, n'ihi na i di ṅaraṅara, i kpoghi kwa ọku i jughi kwa oyi, M'gāb͕ọpu gi n'ọnum. 17 N'ihi na i nāsi, Abum ọgaranya. emewo ka m'buru ọgaranya, ọ dighi kwa ihe ọ bula nākpam; i mataghi kwa na gi onwe-gi bu onye ahu nāhuju anya na onye kwesiri ebere na onye dara ob͕eye na onye kpuru ìsì na onye nāb͕a ọtọ: 18 aduam gi ọdú ka i zuru n'akam ọla-edo nke erechaworo n'ọku, ka i we ghọ ọgaranya; ka i zuru kwa uwe ọcha, ka i we bokwasi onwe-gi, ka ewe ghara ime ka ihere nke ib͕a-ọtọ-gi puta ìhè; ka i zuru kwa ọgwu-anya ite n'anya-gi, ka i we nāhu uzọ. 19 Ka ha ra, bú ndi Mu onwem huru n'anya, anamatu ha nmehie ha n'anya, zí kwa ha ihe site n'inye ha ahuhu: ya mere, nānu ọku n'obi, chèghari kwa. 20 Le, anameguzo n'ọnu-uzọ, nāku kwa aka: ọ buru na onye ọ bula anu olum, meghe kwa uzọ, M'gābakute ya, so kwa ya ri nri-anyasi, ya onwe-ya gēsokwam rie. 21 Onye nēmeri emeri, ya ka M'gēkweye ka o som nọdu ala n'oche-ezem, dika Mu onwem meri-kwa-ra, we so Nnam nọdu ala n'oche-eze-Ya. 22 Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist.

Nkpughe 4

1 Mb͕e ihe ndia gasiri m'we hu, ma le, ọnu-uzọ ka o gheworo oghe n'elu-igwe, olu mbu m'nu-kwa-ra, olu dika nke opì nākpayerem uka, otù onye nāsi, Rigota n'ebe a, M'gēgosi kwa gi ihe nile nke nāghaghi iputa mb͕e ihe ndia gasiri. 2 Ngwa ngwa emerem ka m'nọ nime Mọ Nsọ: ma le, edebere oche-eze n'elu-igwe, otù Onye nānọkwasi kwa n'oche-eze ahu; 3 Onye ahu Nke nānọdu ala yiri nkume jasper na sardius ma ọ buru na anēle Ya anya: eke-na-ogwurugwu di kwa oche-eze ahu gburugburu, yiri emerald ma ọ buru na anēle ya anya. 4 Orú oche-eze na anọ di kwa oche-eze ahu gburugburu: m'we hu orú ndi-okenye na anọ ka ha nānọkwasi n'oche-eze ndia, ndi eb͕okwasiworo uwe ọcha; ahu-kwa-ram okpu-eze nke ọla-edo n'isi-ha. 5 Àmùmà na olu na éb͕è-elu-igwe nēsi kwa n'oche-eze ahu puta. Ọwa nke ọku asa nēnwu n'iru oche-eze ahu, nke bu Mọ asa ahu nke Chineke; 6 ihe di kwa n'iru oche-eze ahu dika oké osimiri eji enyo me yiri crystal; ihe anọ nke di ndu nọ kwa n'etiti oche-eze ahu, nọ kwa oche-eze ahu gburugburu, ndi juputara n'anya anya n'iru na azu. 7 Ihe mbu ahu nke di ndu yiri ọdum, ihe nke-abua ahu nke di ndu yi-kwa-ra nwa-ehi, ihe nke-atọ ahu nke di ndu nwe-kwa-ra iru dika nke madu, ihe nke-anọ ahu nke di ndu yi-kwa-ra ugo nēfe efe. 8 Ihe anọ ahu nke di ndu nwe-kwa-ra nkù isi n'otù n'otù, ha juputa-kwa-ra n'anya anya gburugburu, ya na nime: ha adighi-ezu ike ehihie na abali, nāsi, Nsọ, nsọ, nsọ, ka Onye ahu di, bú Onye-nwe-ayi Chineke, Onye puru ime ihe nile, Onye diri, Onye nādi kwa adi, Onye nābia kwa. 9 Mb͕e ọ bula ihe anọ ahu nke di ndu gēnye Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu otuto na nsọpuru na ekele, bú Onye nādi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi, 10 orú ndi-okenye na anọ ahu gāda n'ala n'iru Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu, ha gākpọ kwa isi ala nye Ya, bú Onye ahu Nke nādi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi, ha gātudà kwa okpu-eze-ha n'iru oche-eze ahu, nāsi, 11 Gi, Onye-nwe-ayi na Chineke-ayi, I kwesiri inara otuto nile na nsọpuru nile na ike nile: n'ihi na Gi onwe-gi kère ihe nile, ọ bu kwa n'ihi ọchichọ-Gi ka ha diri, ka ekè-kwa-ra ha èkè.

Nkpughe 5

1 M'we hu akwukwọ nke edere ya-ri ihe n'ime na azu, nke eji-kwa-rari akàrà asa kasie ya ike, ka ọ di n'aka-nri Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu. 2 M'we hu mọ-ozi di ike, ka o nēwere oké olu nēkwusa, si, Ònye kwesiri isaghe akwukwọ ahu, na inyawapu akàrà-ya? 3 Ọ dighi kwa onye ọ bula di n'elu-igwe, ma-ọbu n'elu uwa, ma-ọbu n'okpuru uwa, puru isaghe akwukwọ ahu, ma-ọbu ile ya anya. 4 M'we kwa ákwá nke-uku, n'ihi na ahughi onye ọ bula kwesiri isaghe akwukwọ ahu, ma-ọbu ile ya anya: 5 otù onye n'etiti ndi-okenye ahu we sim, Akwala ákwá: le, Ọdum ahu Nke si n'ebo Juda puta, Onye bu Nkpọrọgwu nke Devid, O kwesiri, isaghe akwukwọ ahu na akàrà-ya asa. 6 M'we hu Nwa-aturu ka O nēguzo n'etiti oche-eze ahu na ihe anọ ahu nke di ndu, guzo kwa n'etiti ndi-okenye ahu, dika agāsi na eb͕uru Ya-ri, O nwe-kwa-ra mpi asa, na anya asa, nke bu Mọ asa ahu nke Chineke, bú nke ezigaworo ha n'uwa nile. 7 O we bia, Ọ narawo kwa akwukwọ ahu n'aka-nri Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu. 8 Mb͕e Ọ natara akwukwọ ahu, ihe anọ ahu nke di ndu na orú ndi-okenye na anọ ahu we da n'ala n'iru Nwa-aturu ahu, ha nile n'otù n'otù nwere ubọ-akwara, na ọkwa nke eji ọla-edo me nke juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, nke bu ekpere ndi nsọ. 9 Ha nābù kwa abù ọhu, si, I kwesiri inata akwukwọ ahu, na isaghe akàrà-ya: n'ihi na eb͕uru Gi eb͕u, I were kwa ọbara-Gi b͕atara Chineke madu si n'ebo nile ọ bula, na asusu nile ọ bula, na ndi nile ọ bula, na mba nile ọ bula, puta, 10 I we me ha ka ha buru ala-eze na ndi-nchu-àjà nye Chineke-ayi; ha bu kwa eze n'elu uwa. 11 M'we hu, nu kwa olu ọtutu ndi-mọ-ozi ndi nọ oche-eze ahu na ihe anọ ahu nke di ndu na ndi-okenye ahu gburugburu; ọnu-ọgugu-ha riri oké nne nke-uku, nke anāpughi iguta ha; 12 anurum ka ha were oké olu nāsi, O kwesiri, bú Nwa-aturu ahu Nke eb͕uworo eb͕u, inata ike nile, na àkù, na amam-ihe, na ume, na nsọpuru, na otuto, na ngọzi. 13 M'we nu ihe nile ọ bula ekère èkè nke di n'elu-igwe, na n'elu uwa, na n'okpuru uwa, na n'elu oké osimiri, ha na ihe nile di ha nime, ka ha nāsi, Ọ bu Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu, Ya na Nwa-aturu ahu, ka ngọzi nile na nsọpuru nile na otuto nile na ike nile diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. 14 Ihe anọ nke di ndu we si, Amen. Ndi-okenye ahu we da n'ala we kpọ isi ala.

Nkpughe 6

1 M'we hu mb͕e Nwa-aturu ahu saghere otù nime akàrà asa ahu, m'we nu otù nime ihe anọ ahu nke di ndu, ka ọ nāsi, dika agāsi na o ji olu éb͕è-elu-igwe nēkwu, si, Bia. 2 M'we hu, ma le, inyinya ọcha, Onye nānọkwasi ya nwe-kwa-ra uta; ewe nye Ya okpu-eze: O we puta nēmeri, ya na ka O we meri. 3 Mb͕e Ọ saghe-kwa-ra akàrà nke-abua, m'we nu ihe nke-abua ahu nke di ndu, ka ọ nāsi, Bia. 4 Inyinya ọzọ we puta, bú inyinya nke nācha ọku ọku: ewe nye onye nānọkwasi ya ike inapu udo n'uwa, ya na ka ha we b͕urita onwe-ha: ewe nye ya oké mma-agha. 5 Mb͕e Ọ saghe-kwa-ra akàrà nke-atọ, m'we nu ihe nke-atọ ahu nke di ndu, ka ọ nāsi, Bia. M'we hu, ma le, inyinya oji; onye nānọkwasi ya nwe-kwa-ra ihe-ọtùtù n'aka-ya. 6 M'we nu dika agāsi na ọ bu otu n'etiti ihe anọ ahu nke di ndu, ka ọ nāsi, Otù ọtùtù ntà nke ọkà bu otù shilling, ọtùtù ntà atọ nke barley bu otù shilling; emejọ-kwa-la manu na manya-vine. 7 Mb͕e Ọ saghe-kwa-ra akàrà nke-anọ, m'we nu olu nke ihe nke-anọ ahu nke di ndu, ka ọ nāsi, Bia. 8 M'we hu, ma le, inyinya nke aru-ya yiri ozu: onye nānọkwasi kwa ya, aha-ya bu Ọnwu; Hedis we so ya ga. Ewe nye ha ike ichi otù uzọ n'uzọ anọ nke uwa, iji mma-agha, na iji oké unwu, na iji ọnwu, nēb͕u, iwere kwa anu-ọhia nke uwa nēb͕u. 9 Mb͕e Ọ saghe-kwa-ra akàrà nke-ise, m'we hu n'okpuru ebe-ichu-àjà ahu nkpuru-obi nke ndi eb͕ururi n'ihi okwu Chineke, na n'ihi àmà ahu nke ha nwere: 10 ha we were oké olu tie nkpu, si, Rùe ole mb͕e, Onye-nwe-ayi, Onye di nsọ, buru kwa Onye-ezi-okwu, ka I nēkpeghi ikpé bọ̀ kwa ọ́bọ̀ ọbara-ayi n'isi ndi bi n'elu uwa? 11 Ewe nye ha n'otù n'otù uwe-nwuda di ọcha; ewe si ha, ka ha zuru ike nwa oge ọzọ, rue mb͕e ndi-orù-ibe-ha na umu-nna-ha gēzu kwa ezù, bú ndi agaje ib͕u dika eb͕u-kwa-ra ha onwe-ha. 12 M'we hu mb͕e Ọ saghere akàrà nke-isi, oké ala-ọma-jijiji we da; anyanwu we ghọ oji dika ákwà-nkpe nēji nji nke eji aji anu kpa, ewe me ọnwa ka ọ gbaze ka ọbara: 13 kpakpando nile nke elu-igwe we da rue ala, dika osisi fig nātupu nkpuru-ya nāchaghi acha, mb͕e oké ifufe nēfeghari ya. 14 Ewe kewapu elu-igwe dika akwukwọ-odide mb͕e anāpiakọta ya; ewe wepu ugwu nile na agwe-etiti nile ọ bula n'ọnọdu-ha. 15 Ndi-eze nke uwa, na ndi-amadi, na ndi-isi-ọchi-agha, na ndi-ọgaranya, na ndi di ike, na orù ọ bula, na onye ọ bula nwere onwe-ya, we zobe onwe-ha nime ọb͕à na nime oké nkume nke ugwu: 16 ha nāsi kwa ugwu na oké nkume ahu, Dakwasinu ayi, zopu ayi n'iru Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu, zopu kwa ayi n'iwe nke Nwa-aturu ahu: 17 n'ihi na oké ubọchi nke iwe-ha abiawo; ònye pu-kwa-ra iguzo?

Nkpughe 7

1 Mb͕e nka gasiri m'we hu ndi-mọ-ozi anọ ka ha nēguzo n'elu nkuku anọ nke uwa, nējidesi ifufe anọ nke uwa ike, ka ifufe ọ bula we ghara ife n'elu uwa, ma-ọbu n'elu oké osimiri, ma-ọbu n'elu osisi ọ bula. 2 M'we hu mọ-ozi ọzọ ka o nēsi n'ọwuwa-anyanwu rigo, nēnwe akàrà nke Chineke di ndu; o we were oké olu tiere ndi-mọ-ozi anọ ahu nkpu, bú ndi enyere ha ike imejọ uwa na oké osimiri, 3 si, Emejọla uwa, ma-ọbu oké osimiri, ma-ọbu osisi, rue mb͕e ayi gākasiwo ndi-orù Chineke-ayi akàrà n'egedege-iru-ha. 4 M'we nu ọnu-ọgugu ndi akarari, ọgu nnù iri na ọgu nnù asatọ, ndi akarari akàrà site n'ebo nile ọ bula nke umu Israel. 5 Akarari akàrà site n'ebo Juda orú nnù na nnù iri: Site n'ebo Reuben orú nnù na nnù iri: Site n'ebo Gad orú nnù na nnù iri: 6 Site n'ebo Asha orú nnù na nnù iri: Site n'ebo Naftali orú nnù na nnù iri: Site n'ebo Manase orú nnù na nnù iri: 7 Site n'ebo Simeon orù nnù na nnù iri: Site n'ebo Livai orú nnù na nnù iri: Site n'ebo Isaka orú nnù na nnù iri: 8 Site n'ebo Zebulum orú nnù na nnù iri: Site n'ebo Josef orú nnù na nnù iri: Site n'ebo Benjamin orú nnù na nnù iri: 9 Mb͕e ihe ndia gasiri m'we hu, ma le, oké ìgwè madu, nke onye ọ bula nāpughi iguta ọnu, ndi si na mba nile ọ bula, na ebo nile, na ndi nile, na asusu nile, puta, nēguzo n'iru oche-eze ahu na n'iru Nwa-aturu ahu, eb͕okwasiworo ha uwe-nwuda di ọcha, igu-nkwu di kwa n'aka-ha; 10 ha we were oké olu tie nkpu, si, Nzọputa diri Chineke-ayi, Onye nānọkwasi n'oche-eze ahu, di-kwa-ra Nwa-aturu ahu. 11 Ndi-mọ-ozi nile nēguzo kwa oche-eze ahu na ndi-okenye ahu na ihe anọ ahu nke di ndu gburugburu; ha we da kpuchie iru-ha n'ala n'iru oche-eze ahu, we kpọ isi ala nye Chineke, 12 si, Amen: Ngọzi nile, na otuto nile, na amam-ihe nile, na ekele nile, na nsọpuru nile, na ike nile, na ume nile, diri Chineke-ayi rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen. 13 Otù n'etiti ndi-okenye ahu we za, sim, Ndia ndi eb͕okwasiworo uwe-nwuda ahu di ọcha, hà bu ole ndi, òle ebe ha si bia kwa? 14 M'we si ya, Onye-nwem, gi onwe-gi matara. O we sim, Ndia bu ndi nēsi n'oké nkpab͕u ahu puta, ha sa-kwa-ra uwe-nwuda-ha, me kwa ka ha di ọcha nime ọbara Nwa-aturu ahu. 15 N'ihi nka ka ha nọ n'iru oche-eze Chineke; ha nēfè kwa Ya òfùfè ehihie na abali n'ulo nsọ Ya: Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu gāb͕asa kwa ulo-ikwū-Ya n'isi-ha. 16 Agu agaghi-agu ha ọzọ, akpiri agaghi-akpọ kwa ha nku ọzọ; anyanwu agaghi-acha kwa ha ọzọ, ma-ọbu okpom-ọku ọ bula: 17 n'ihi na Nwa-aturu ahu Nke nọ n'etiti oche-eze ahu gāzù ha dika aturu, Ọ gēduru kwa ha ga n'isi-iyi nke miri nke ndu: Chineke gēhichapu kwa anya-miri nile ọ bula n'anya-ha.

Nkpughe 8

1 Mb͕e Ọ saghe-kwa-ra akàrà nke-asa, ewe dere ji n'elu-igwe oge ra ka nkera nke otù hour. 2 M'we hu ndi-mọ-ozi asa ahu ndi nēguzo n'iru Chineke; ewe nye ha opì asa. 3 Mọ-ozi ọzọ we bia guzo n'elu ebe-ichu-àjà ahu, nēnwe ihe nke ọla-edo eji esure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; ewe nye ya ọtutu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ka ọ we tukwasi ha n'ekpere ndi nsọ nile nke di n'elu ebe-ichu-àjà ahu nke ọla-edo nke di n'iru oche-eze ahu. 4 Anwuru-ọku nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ ahu soro ekpere ndi nsọ site n'aka mọ-ozi ahu rigo n'iru Chineke. 5 Mọ-ozi ahu we were ihe ahu eji esure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; o we kpojue ya n-ọku nke sitere n'ọku nke ebe-ichu-àjà ahu, we tubà ya n'uwa: éb͕è-elu-igwe, na olu na àmùmà, na ala-ọma-jijiji we so. 6 Ndi-mọ-ozi asa ahu ndi nwere opì asa ahu doziri onwe-ha ifù opì. 7 Onye mbu we fùa opì, ákú-miri-ígwé na ọku we so, nke agwarari ọbara, ewe tubà ha n'uwa: ọku we b͕achasia otù uzọ n'uzọ atọ nke uwa, ọku b͕achasi-kwa-ra otù uzọ n'uzọ atọ nke osisi, ọku b͕achasi-kwa-ra ahihia ndu nile. 8 Mọ-ozi nke-abua we fùa opì, ewe tubà ihe dika oké ugwu nke nēre ọku nime oké osimiri: otù uzọ n'uzọ atọ nke oké osimiri we ghọ ọbara; 9 otù uzọ n'uzọ atọ nke ihe nile ekère èkè nke di n'oké osimiri we nwua, bú ihe nwere ndu; emebi-kwa-ra otù uzọ n'uzọ atọ nke ub͕ọ nile. 10 Mọ-ozi nke-atọ we fùa opì, oké kpakpando we site n'elu-igwe da, nke nēre ọku dika ọwa, o we da n'elu otù uzọ n'uzọ atọ nke osimiri nile, da kwa n'elu isi-iyi miri nile; 11 aha anākpọ kwa kpakpando ahu bu Wormwood: otù uzọ n'uzọ atọ nke miri nile we ghọ wormwood; ọtutu madu we site n'iṅu miri ahu nwua, n'ihi na emere ka ha nēlu ilu. 12 Mọ-ozi nke-anọ we fùa opì, ewe tie otù uzọ atọ nke anyanwu ihe, ya na otù uzọ n'uzọ atọ nke ọnwa, na otù uzọ n'uzọ atọ nke kpakpando nile; ka otù uzọ n'uzọ atọ nime ha we b͕a ọchichiri, ka ehihie we ghara kwa iputa ìhè n'otù uzọ n'uzọ atọ nime ya, ka ọchichiri we me kwa otú a. 13 M'we hu, nu kwa otù ugo, ka ọ nēfe n'etiti elu-igwe, were kwa oké olu si, Ahuhu, ahuhu, ahuhu, ka ha gāhu, bú ndi bi n'elu uwa, site n'olu fọduru nke opì ndi-mọ-ozi atọ, ndi gaje ifù opì.

Nkpughe 9

1 Mọ-ozi nke-ise we fùa opì, m'we hu kpakpando nke sitereri n'elu-igwe da n'uwa: ewe nye ya nkpisi-ugodi nke olùlù nke abyss ahu. 2 O we meghe olùlù nke abyss ahu; anwuru-ọku we si n'olùlù ahu kwugo, dika anwuru-ọku nke oké ọku; anyanwu na mbara-elu-igwe we site n'anwuru-ọku nke olùlù ahu b͕a ọchichiri. 3 Igurube we si n'anwuru-ọku ahu puta je n'uwa; ewe nye ha ike, dika akpi nke uwa nwere ike. 4 Ewe gwa ha ka ha ghara imejọ ahihia nke uwa, ma-ọbu ihe ọ bula nwere akwukwọ ndu, ma-ọbu osisi ọ bula, ma ka ha mejọ nání madu, bú ndi ahu nēnweghi akàrà nke Chineke n'egedege-iru-ha. 5 Ewe nye ha ike ka ha ghara ib͕u ha, kama ka ewe mekpa ha aru ọnwa ise: nmekpa-aru-ha di ka nmeka-aru nke akpi, mb͕e ọ bula ọ nāb͕a madu. 6 N'ubọchi ahu madu gāchọ kwa ọnwu, ha agaghi-ahu kwa ya ma-ọli; agu inwu ọnwu gāgu kwa ha, ọnwu we b͕anari ha. 7 Oyiyi igurube ahu yiri inyinya edoziworo ije agha; n'isi-ha ka ha nēkpu ihe dika okpu-eze yiri ọla-edo, iru-ha di kwa ka iru madu. 8 Ha nwe-kwa-ra agiri-isi dika agiri-isi ndinyom, ezé-ha di kwa ka ezé ọdum. 9 Ha nwe-kwa-ra ihe-agha ib͕ochi obi, dika ihe-agha ib͕ochi obi nke ígwè; nkpatu nkù-ha di kwa ka nkpatu nke ub͕ọ-ala, nke ọtutu inyinya nāb͕a ọsọ ije agha. 10 Ha nwe-kwa-ra ọdudù yiri ọdudù akpi, nwe ihe-ọb͕ub͕a; nime ọdudù-ha ike-ha di imejọ madu ọnwa ise. 11 Ha nwere mọ-ozi ahu nke abyss ahu dika eze-ha: aha-ya n'asusu Hibru bu Abadon, n'asusu Grik o nwe-kwa-ra aha Apọlion. 12 Ahuhu mbu agabigawo: le, ahuhu abua ọzọ fọduru ibia, mb͕e ihe ndia gasiri. 13 Mọ-ozi nke-isi we fùa opì, m'we nu otù olu nke si na mpi nke ebe-ichu-àjà ahu eji ọla-edo me puta, bú nke di n'iru Chineke, 14 M'we nu otù onye, ka ọ nāgwa mọ-ozi nke-isi ahu okwu, bú onye nwere opì ahu, si, Tọpu ndi-mọ-ozi anọ ahu ndi ekeworo ab͕u n'osimiri uku Yufretis. 15 Ewe tọpu ndi-mọ-ozi anọ ahu, ndi edoziriri nye oge hour na ubọchi na ọnwa na arọ ahu, ka ha we b͕ue otù uzọ n'uzọ atọ nke madu. 16 Ọnu-ọgugu usu-ndi-agha ahu, nke bu ndi-inyinya, di ọgu million iri: anurum ọnu-ọgugu-ha. 17 Otù a ka m'hu-kwa-ra inyinya ahu n'ọhù ahu, ha na ndi nānọkwasi ha, nēnwe ihe-agha ihe-agha ib͕ochi obi nke yiri ọku na hyacinth na brimstone: isi inyinya ahu di kwa ka isi ọdum; ọku na anwuru-ọku na brimstone nēsi kwa n'ọnu-ha puta. 18 Esitere n'ihe-otiti atọ ndia b͕u otù uzọ n'uzọ atọ nke madu nile, ya bu site n'ọku ahu na anwuru-ọku ahu na brimstone ahu, nke nēsi n'ọnu-ha puta. 19 N'ihi na ike inyinya ahu di n'ọnu-ha, di kwa n'ọdudù-ha: n'ihi na ọdudù-ha yiri agwọ, nwe kwa isi; ha were kwa ha nēmejọ. 20 Ma ndi fọduru n'etiti madu, ndi anēb͕ughi n'ihe-otiti ndia, echègharighi isi n'ọlu nile nke aka-ha puta, ka ha we ghara ikpọ isi ala nye ndi-mọ ọjọ, ha na arusi-ha nke ọla-edo, na nke ọla-ọcha, na nke ọla, na nke nkume, na nke osisi; nke nāpughi ile ihe anya, ma-ọbu inu ihe, ma-ọbu ije ije: 21 ha echègharighi kwa isi n'ib͕u-madu-ha, ma-ọbu n'igwọ-nsi-ha, ma-ọbu n'ikwa-iko-ha, ma-ọbu n'izu-ori-ha, puta.

Nkpughe 10

1 M'we hu mọ-ozi ọzọ di ike, ka ọ nēsi n'elu-igwe ridata, nke eb͕okwasiworo ya igwe-oji dika uwe; eke-na-ogwurugwu ahu di kwa n'isi-ya, iru-ya di kwa ka anyanwu, ukwu-ya abua di kwa ka ide ọku; 2 ọ nējide kwa nwa akwukwọ ntà n'aka-ya, nke asagheworo: o we tukwasi ukwu aka-nri ya n'elu oké osimiri tukwasi kwa ukwu aka-ekpe ya n'elu ala; 3 o we were oké olu tie nkpu, dika ọdum nāb͕ọ uja: mb͕e o tiri nkpu, éb͕è-elu-igwe asa ahu we kwue olu-ha. 4 Ma mb͕e éb͕è-elu-igwe asa ahu kwuru okwu, agajem ide akwukwọ: m'we nu olu si n'elu-igwe da, si Kà ihe éb͕è-elu igwe asa ahu kwuru akàrà, ede-kwa-la ha n'akwukwọ. 5 Mọ-ozi ahu, nke m'huru ka ọ nēguzo n'elu oké osimiri na n'elu ala, we welie aka-nri-ya zó n'elu-igwe, 6 we were Onye ahu Nke nādi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi, bú Onye kère elu-igwe na ihe nile di ya nime, na uwa na ihe nile di ya nime, na oké osimiri na ihe nile di ya nime, ṅu iyi na oge agaghi-adi kwa ọzọ: 7 ma n'ubọchi nke olu mọ-ozi nke-asa ahu, mb͕e ọ gaje ifù opì, agēme kwa ka ihe-omimi nke Chineke zu okè, dika O zìri ozi ọma nye ndi-orù-Ya, bú ndi amuma-Ya. 8 Olu ahu nke m'nuru ka ọ nēsi n'elu-igwe da, anu-kwa-ram ya ọzọ ka ọ nākpayerem uka, si, Je, nara akwukwọ ahu nke asagheworo, bú nke di n'aka mọ-ozi ahu onye nēguzo n'elu oké osimiri na n'elu ala. 9 M'we jekuru mọ-ozi ahu, si ya ka o nyem nwa akwukwọ ntà ahu. O we sim, Nara ya, ripia kwa ya; ọ gēme kwa ka afọ-gi lue ilu, ma n'ọnu-gi ọ gātọ utọ dika manu-aṅu. 10 M'we nara nwa akwukwọ ntà ahu n'aka mọ-ozi ahu, we ripia ya; o we tọ utọ n'ọnum dika manu-aṅu; mb͕e m'ripiasiri ya, ewe me ka afọm lue ilu. 11 Ha nāsikwam, I ghaghi ibu amumá ọzọ bayere ọtutu ndi na ọtutu mba na ọtutu asūsū na ọtutu eze.

Nkpughe 11

1 Ewe nyem amì yiri nkpa-n'aka: otù onye we si, Bilie, tù kwa ulo nsọ nke Chineke, na ebe-ichu-àjà-ya, na ndi nākpọ isi ala nime ya. 2 Ma obí nke di n'èzí ulo nsọ ahu, rapu ya n'èzí, atù-kwa-la; n'ihi na ewerowo ya nye ndi mba ọzọ: ha gāzọda kwa obodo nsọ ahu ọgu ọnwa abua na abua. 3 M'gēnye kwa ndi-àmàm abua ike, ha gēbu kwa amuma nnù ubọchi atọ na ọgu atọ, eb͕okwasiwo kwa ha ákwà-nkpe. 4 Ndia bu osisi olive abua ahu na ihe-idọba-oriọna abua ahu, ndi nēguzo n'iru Onye-nwe uwa. 5 Ọ buru kwa na onye ọ bula chọrọ imejọ ha, ọku nēsi n'ọnu-ha puta, nēripia kwa ndi-iro-ha; ọ buru kwa na onye ọ bula gāchọ imejọ ha, aghaghi ib͕u ya otú a. 6 Ndia nwere ike imechi elu-igwe, ka miri we ghara izo n'ubọchi nile nke amuma-ha: ha nwe-kwa-ra ike n'ebe miri nile di, ime ka ha b͕anwè ọbara, na iwere ihe-otiti nile ọ bula tie uwa, ka mb͕e ha gāchọ ra. 7 Ma mb͕e ọ bula ha gāb͕azuwo àmà-ha, anu-ọhia ahu nke nēsi n'abyss ahu rigoputa gēbu agha megide ha, meri kwa ha, b͕u kwa ha. 8 Ozu-ha we di n'amá nke obodo uku ahu, bú nke anākpọ Sọdọm na Ijipt n'uzọ nke Mọ Nsọ, ebe akpọgide-kwa-ra Onye-nwe-ha n'obe. 9 Madu we si n'etiti ndi nile na ebo nile na asusu nile na mba nile puta nēle ozu-ha ubọchi atọ na nkera otù ubọchi, ha ekweghi kwa ka atọb͕ọ ozu-ha n'ílì. 10 Ndi bi n'elu uwa nāṅuri kwa ọṅu n'isi ha, obi nātọ kwa ha utọ; ha gēzigarita kwa onwe-ha onyinye; n'ihi na ndi-amuma abua ndia mekpara ndi bi n'elu uwa aru. 11 Mb͕e ubọchi atọ na nkera otù ubọchi ahu gasiri Mọ nke ndu nke si na Chineke puta we bata nime ha, ha we guzo n'ukwu-ha; oké egwu we dakwasi ndi nēkiri ha. 12 Ha we nu oké olu nke si n'elu-igwe da, ka ọ nāsi ha, Rigotanu n'ebe a. Ha we rigo rue n'elu-igwe nime igwe-oji ahu; ndi-iro-ha kiri-kwa-ra ha. 13 N'otù oge hour ahu oké ala-ọma-jijiji we da, otù uzọ n'uzọ iri nke obodo ahu we da rue ala; ewe b͕ue nnù madu iri na nnù asa na ọgu iri nime ala-ọma-jijiji ahu, bú ndi nwere aha: ndi fọduru we tua egwu, ha we nye Chineke nke elu-igwe otuto. 14 Ahuhu nke-abua agabigawo: le, Ahuhu nke-atọ nābia ọsọsọ. 15 Mọ-ozi nke-asa we fùa opì; oké olu we da n'elu-igwe, ha we si, Ala-eze nke uwa aghọwo ala-eze nke Onye-nwe-ayi, na nke Kraist-Ya: Ọ gābu kwa eze rue mb͕e nile ebighi-ebi. 16 Orú ndi-okenye na anọ ahu, ndi nānọdu n'iru Chineke n'elu oche-eze-ha, we da kpuchie iru ha n'ala, we kpọ isi ala nye Chineke, 17 si, Ayi nēkele Gi, Onye-nwe-ayi Chineke, Onye puru ime ihe nile, Onye nādi adi, Onye di-kwa-ri; n'ihi na I werewo oké ike-Gi, I bukwa eze. 18 Mba nile we we iwe, iwe-Gi we bia, ya na oge ikpe ndi nwuru anwu ikpé, na inye ndi-orù-Gi, bú ndi-amuma, na ndi nsọ, na ndi nātu egwu aha-Gi, ndi ntà na ndi uku, ugwọ-ọlu-ha; na imebi ndi ahu nēmebi uwa. 19 Ewe meghe ulo nsọ nke Chineke nke di n'elu-igwe; ewe hu ib͕e nke ọb͕ub͕a-ndu-Ya n'ulo nsọ Ya; àmùmà, na olu, na éb͕è-elu-igwe, na ala-ọma-jijiji, na oké ákú-miri-ígwé we so.

Nkpughe 12

1 Ewe hu oké ihe-iriba-ama n'elu-igwe; nwanyi nke egbokwasiworo ya anyanwu dika uwe, ọnwa di kwa n'okpuru ukwu-ya abua, ọ nēkpu kwa okpu-eze nke kpakpando iri na abua n'isi-ya; 2 ọ di kwa ime: o we tie nkpu, ebe ime nēme ya, anēmekpa kwa ya aru imuputa nwa. 3 Ewe hu ihe-iriba-ama ọzọ n'elu-igwe; ma le, oké dragon nke nācha ọku ọku, nke nwere isi asa na mpi iri, nēkpu kwa okpu-eze asa n'isi-ya. 4 Ọdudù-ya nādọrọ kwa otù uzọ n'uzọ atọ nke kpakpando nke elu-igwe, o we tudà ha n'ala: dragon ahu we guzo n'iru nwanyi ahu onye gaje imuputa nwa, ka o we ripia Nwa-ya mb͕e ọ bula ọ gāmuputa Ya. 5 O we muputa Ọkpara, bú Nwa-nwoke, Onye gēji nkpa-n'aka ígwè zù mba nile dika aturu: ewe punara ya Nwa-ya ahu la n'ebe Chineke nọ, na n'ebe oche-eze-Ya di. 6 Nwanyi ahu we b͕alaga nime ọhia, ebe o nwere ọnọdu edoziworo site n'aka Chineke, ka ha we zùa ya n'ebe ahu nnù ubọchi atọ na ọgu atọ. 7 Agha we puta n'elu-igwe: Maikael na ndi-mọ-ozi-ya buru agha megide dragon ahu; dragon ahu na ndi-mọ-ozi-ya we bue agha; 8 ha enweghi kwa ike, ahughi kwa ọnọdu-ha ọzọ n'elu-igwe. 9 Ewe chudà dragon uku ahu, bú agwọ ochie ahu, onye anākpọ Ekwensu na Setan, onye nēduhie uwa nile madu bi; achudara ya n'uwa, chudà kwa ndi-mọ-ozi-ya, ha na ya. 10 M'we nu oké olu ka ọ nādà n'elu-igwe, si, Ub͕u a ka ọ biaworo, bú nzọputa ahu, na ike ahu, na ala-eze Chineke-ayi, na ichi-isi nke Kraist-Ya: n'ihi na achudara onye ahu nke nēbo umu-nna-ayi ebubo, onye nēbo ha ebubo n'iru Chineke-ayi ehihie na abali. 11 Ndi ahu we merie ya n'ihi ọbara Nwa-aturu ahu, na n'ihi okwu àmà-ha; ha ahughi kwa ndu-ha n'anya rue ọnwu. 12 N'ihi nka, ka obi nātọ unu utọ, unu elu-igwe nile, na unu ndi bi nime ha. Ahuhu gādiri uwa na oké osimiri: n'ihi na ekwensu aridakuruwo unu, nēnwe oké ọnuma, ebe ọ matara na o nwere nání nwa oge. 13 Mb͕e dragon ahu huru na achudara ya-ri n'uwa, o we sob͕ue nwanyi ahu, bú nwanyi nke muputara Nwa-nwoke ahu. 14 Ewe nye nwanyi ahu nkù abua ahu nke oké ugo ahu, ka o we febà n'ọhia la n'ọnọdu-ya, ebe anāzù ya otù oge, na oge abua, na nkera otù oge, ka ọ pua n'iru agwọ ahu. 15 Agwọ ahu we b͕uputa miri n'ọnu-ya n'azu nwanyi ahu dika osimiri, ka o we me ka osimiri ahu bupu ya. 16 Ala we yere nwanyi ahu aka, ala we saghe ọnu-ya, loda osimiri ahu, nke dragon ahu b͕uputara n'ọnu-ya. 17 Dragon ahu we wesa nwanyi ahu iwe, we pua ibu agha megide nkpuru-ya fọduru, bú ndi nēdebe ihe nile Chineke nyere n'iwu, ndi nēnwe kwa àmà nke Jisus:

Nkpughe 13

1 o we guzọ n'ájá oké osimiri. M'we hu anu-ọhia ka ọ nēsi n'oké osimiri rigoputa, nēnwe mpi iri na isi asa, nēkpu kwa okpu-eze iri n'elu mpi-ya, nēnwe kwa aha ufọdu nke nkwulu Chineke n'elu isi-ya. 2 Anu-ọhia nke m'huru yi-kwa-ra agu, ukwu-ya di kwa ka ukwu bear, ọnu-ya di kwa ka ọnu ọdum: dragon ahu we nye ya ike-ya, na oche-eze-ya, na oké ichi-isi. 3 M'we hu otù n'etiti isi asa ya, dika agāsi na etib͕uru ya-ri ọ nwua; ewe me ka ihe-otiti-ya ahu nke nēweta ọnwu la: o we ju uwa dum anya, ha we so anu-ọhia ahu n'azu; 4 ha we kpọ isi ala nye dragon ahu, n'ihi na o nyere anu-ọhia ahu ichi-isi-ya; ha kpọ-kwa-ra isi ala nye anu-ọhia ahu, si, Ònye yiri anu-ọhia ahu? ònye pu-kwa-ra ibu agha megide ya? 5 ewe nye ya ọnu nke nēkwu oké ihe n'ikwulu Chineke; ewe nye ya ike ime omume-ya ọgu ọnwa abua na abua. 6 O we saghe ọnu-ya ikwulu Chineke, ikwulu aha-Ya, na ulo-ikwū-Ya, bú ndi bi n'elu-igwe. 7 Ewe nye ya ike ibu agha megide ndi nsọ ahu, na imeri ha: enye-kwa-ra ya ike ichi ebo nile ọ bula na ndi nile ọ bula na asusu nile ọ bula na mba nile ọ bula isi. 8 Ndi nile ndi bi n'elu uwa gākpọ kwa isi ala nye ya, onye ọ bula anēdeghi aha-ya n'akwukwọ nke ndu nke Nwa-aturu ahu Onye eb͕uworo site n'oge itọ ntọ-ala nke uwa. 9 Ọ buru na onye ọ bula nwere nti, ya nu. 10 Ọ buru na ọ diri onye ọ bula ka adọta ya n'agha, ọ bu n'agha ka agādọta ya: ọ buru na onye ọ bula gēji mma-agha b͕u madu, aghaghi iji mma-agha b͕u ya. Nebe a ka ntachi-obi na okwukwe nke ndi nsọ di. 11 M'we hu anu-ọhia ọzọ ka ọ nēsi n'ala rigoputa; o nwe-kwa-ra mpi abua yiri nke Nwa-aturu ahu, ma ọ nēkwu okwu dika dragon ahu. 12 O we nāchi isi nile nke anu-ọhia mbu ahu n'iru ya. Ọ nēme kwa uwa na ndi bi nime ya ka ha kpọ isi ala nye anu-ọhia mbu ahu, nke emere ka ihe-otiti-ya nke nēweta ọnwu la. 13 ọ nēme kwa oké ihe-iriba-ama di iche iche, ka o we me ọbuná ọku ka o si n'elu-igwe ridata n'uwa n'iru madu nile. 14 O we nēduhie ndi bi n'elu uwa n'ihi ihe-iriba-ama nile nke enyere ya ike ime n'iru anu-ọhia ahu; nāsi ndi bi n'elu uwa, ka ha kpuara anu-ọhia ahu ihe-oyiyi, bú nke nwere ob͕ub͕u-mma-agha ahu, we di ndu. 15 Ewe nye ya ike inye ya ume, bú ihe-oyiyi nke anu-ọhia ahu, ka ihe-oyiyi nke anu-ọhia ahu we kwue okwu, me kwa ka eb͕ue ha, ka ha ra, bú ndi ọ bula nākpọghi isi ala nye ihe-oyiyi nke anu-ọhia ahu. 16 Ọ nēme kwa madu nile, ndi ntà na ndi uku, na ndi-ọgaranya na ndi-ob͕eye, na ndi nwere onwe-ha na ndi-orù, ka akà ha akàrà n'aka-nri-ha, ma-ọbu n'egedege-iru-ha; 17 ka onye ọ bula ghara kwa ipu izuta ahia ma-ọbu ire ihe, ma-ọbughi onye nwere akàrà ahu, bú aha nke anu-ọhia ahu ma-ọbu ọnu-ọgugu aha-ya. 18 N'ebe a ka amam-ihe di. Onye nwere uche, ya gua ọnu-ọgugu nke anu-ọhia ahu; n'ihi na ọ bu ọnu-ọgugu madu: ọnu-ọgugu-ya bu kwa nnù na ọgu iri na ọgu atọ na isi.

Nkpughe 14

1 M'we hu, ma le, Nwa-aturu ahu ka Ọ nēguzo n'ugwu Zaion, Ya na ọgu nnù iri na ọgu nnù asatọ, bú ndi edeworo aha-Ya na aha Nna-Ya n'egedege-iru-ha. 2 M'we nu olu ka ọ nēsi n'elu-igwe dà, dika olu ọtutu miri, di kwa ka olu oke éb͕è-elu-igwe: olu ahu m'nuru di kwa ka olu ndi nākpọ ubọ-akwara mb͕e ha nēwere ubọ-akwara-ha nākpọ: 3 ha we nābù dika agāsi na ọ bu abù ọhu n'iru oche-eze ahu, na n'iru ihe anọ ahu nke di ndu na ndi-okenye ahu: ọ dighi kwa onye ọ bula puru imuta abù ahu ma-ọbughi ọgu nnù iri na ọgu nnù asatọ ahu, bú ndi ab͕atarari n'uwa. 4 Ndia bu ndi nēmerughi onwe-ha n'aru ndinyom; n'ihi na ha di ọcha ka umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke. Ndia bu ndi nēso Nwa-aturu ahu ebe ọ bula Ọ nēje. Ndia ka ab͕atara n'etiti madu, iburu Chineke na Nwa-aturu ahu nkpuru mbu. 5 Ọ dighi kwa ugha ọ bula ahuru n'ọnu-ha: ha bu ndi anātaghi uta. 6 M'we hu mọ-ozi ọzọ ka ọ nēfe n'etiti elu-igwe, nēnwe ozi ọma ebighi-ebi izisara ndi nānọdu n'elu uwa, bú mba nile ọ bula na ebo nile ọ bula na asusu nile ọ bula na ndi nile ọ bula; 7 ọ nēwere kwa oké olu si, Tuanu egwu Chineke, nye kwa Ya otuto; n'ihi na oge hour nke ikpé-Ya abiawo: kpọ-kwa-nu isi ala nye Ya, bú Onye kère elu-igwe na ala, oké osimiri na isi-iyi nile nke miri nile. 8 Mọ-ozi ọzọ, bú nke-abua, we so, si, Ọ dawo, ọ dawo, bú Babilon uku ahu, nke meworo ka mba nile ṅua nime manya nke ọnuma nke ikwa-iko-ya. 9 Mọ-ozi ọzọ, bú nke-atọ, we so ha, were oké olu si, Ọ buru na onye ọ bula nākpọ isi ala nye anu-ọhia ahu na ihe-oyiyi-ya, nānata kwa akàrà-ya n'egedege-iru-ya, ma-ọbu n'aka-ya, 10 ya onwe-ya gāṅu kwa nime manya nke ọnuma Chineke, nke edoziworo nāgwaghi-agwa nime iko nke iwe-Ya; agēji kwa ọku na brimstone mekpa ya aru n'iru ndi-mọ-ozi di nsọ, na n'iru Nwa-aturu ahu: 11 anwuru-ọku nke nmekpa-aru-ha nārigo rue mb͕e nile ebighi-ebi; ha adighi-ezu kwa ike ehihie na abali, bú ndi nākpọ isi ala nye anu-ọhia ahu na ihe-oyiyi-ya, ma ọ buru kwa na onye ọ bula anata akàrà nke aha-ya. 12 N'ebe a ka ntachi-obi ndi nsọ di, bú ndi nēdebe ihe Chineke nyere n'iwu, na okwukwe Jisus. 13 M'we nu olu ka ọ nēsi n'elu-igwe da, si, De akwukwọ, Ngọzi nādiri ndi nwuru anwu, bú ndi gānwu anwu nime Onye-nwe-ayi site n'ub͕u a: e, ka Mọ Nsọ nēkwu, ka ha we si na ndọb͕u nile ha dọb͕uru onwe-ha n'ọlu zuru ike; n'ihi na ọlu nile ha nēso ha ga. 14 M'we hu, ma le, ígwé ọcha; n'elu ígwé ọcha ahu ka m'huru otù Onye yiri nwa nke madu ka Ọ nānọdu ala, nēkpu okpu-eze nke ọla-edo n'isi-Ya, mma-iwe-ihe-ubi di nkọ di kwa n'aka-Ya. 15 Mọ-ozi ọzọ we si n'ulo nsọ ahu puta, nēwere oké olu tiere Onye ahu Nke nānọkwasi n'ígwé ọcha ahu nkpu, si, Tiye mma-iwe-ihe-ubi-Gi, we kwa ihe-ubi: n'ihi na oge hour iwe ihe-ubi abiaruwo; n'ihi na ihe agēwe n'ubi nke uwa achabigawo ókè. 16 Onye ahu Nke nānọkwasi n'ígwé ọcha ahu we tudà mma-iwe-ihe-ubi-Ya n'elu uwa; ewe were uwa dika ihe-ubi. 17 Mọ-ozi ọzọ we si n'ulo nsọ ahu nke di n'elu-igwe puta, ya onwe-ya nwe-kwa-ra mma-iwe-ihe-ubi di nkọ. 18 Mọ-ozi ọzọ we si n'ebe-ichu-àjà ahu puta, bú onye nwere ike n'ebe ọku ahu di; o we were oké olu tiere onye ahu nke nwere mma-iwe-ihe-ubi di nkọ nkpu, si, Tiye mma-iwe-ihe-ubi-gi di nkọ, bipu uyọkọ nile nke vine nke uwa; n'ihi na nkpuru-vine-ya achazuwo. 19 Mọ-ozi ahu we tubà mma-iwe-ihe-ubi-ya n'uwa, we bipu nkpuru-vine nke uwa, tubà ya nime ebe-nzọcha-nkpuru-vine ahu, nke di uku, bú nke ọnuma Chineke. 20 Ewe zọcha ebe-nzọcha-nkpuru-vine ahu n'azu obodo ahu, ọbara we si n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine ahu puta, rue bridle inyinya, ru kwa ihe ra ka nnù furlong anọ.

Nkpughe 15

1 M'we hu ihe-iriba-ama ọzọ n'elu-igwe, nke di uku di kwa ebube, ndi-mọ-ozi asa ndi nwere ihe-ọtiti asa, nke bu nke-ikpe-azu, n'ihi na nime ha ka ọnuma Chineke gwuru. 2 M'we hu dika agāsi na ọ bu oké osimiri eji enyo me nke agwakọworo ya na ọku; ahu-kwa-ram ndi nāputa n'aka anu-ọhia ahu na nmeri, ya na n'aka ihe-oyiyi-ya, na n'aka ọnu-ọgugu aha-ya, ka ha nēguzo n'usọ oké osimiri ahu eji enyo me, nēnwe ubọ-akwara nke Chineke. 3 Ha nābù kwa abù nke Moses, bú orù nke Chineke, na abù nke Nwa-aturu Chineke, si, Ọlu-Gi nile di uku di kwa ebube, Onye-nwe-ayi Chineke, Onye puru ime ihe nile; uzọ-Gi nile ziri ezi, buru kwa ezi-okwu, Gi Eze nke mba nile. 4 Ònye nāgaghi-atu egwu, Onye-nwe-ayi, to kwa aha-Gi? n'ihi na nání Gi di ọcha n'obi; n'ihi na mba nile gābia kpọ kwa isi ala n'iru Gi; n'ihi na emere ka ezi omume-Gi nile puta ìhè. 5 Mb͕e ihe ndia gasiri m'we hu, emeghe-kwa-ra ulo nsọ nke ulo-ikwū nke àmà ahu n'elu-igwe: 6 ndi-mọ-ozi asa ahu ndi nwere ihe-otiti asa ahu we si n'ulo nsọ ahu puta, eb͕okwasiworo ha linen, nke di ọcha nēnwu kwa enwu, ekewo kwa ha ihe-ọkiké ọla-edo n'obi gburugburu. 7 Otù nime ihe anọ ahu nke di ndu we nye ndi-mọ-ozi asa ahu ọkwa ọla-edo asa juputara n'ọnuma Chineke, Onye nādi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi. 8 Ulo nsọ ahu we juputa n'anwuru-ọku nke si n'ebube Chineke puta, si kwa n'ike-Ya puta; ọ dighi kwa onye ọ bula puru ibà nime ulo nsọ ahu, rue mb͕e ihe-otiti asa ahu nke ndi-mọ-ozi asa ahu gāgwu.

Nkpughe 16

1 M'we nu oké olu ka ọ nēsi n'ulo nsọ ahu dà, nāsi ndi-mọ-ozi asa ahu, Jenu, wusi ọkwa asa ahu nke ọnuma Chineke nime uwa. 2 Mọ-ozi mbu we je, wusi ọkwa-ya nime uwa; ajọ ọnyá jọb͕uru onwe-ya we puta n'aru madu nile ndi nwere akàrà anu-ọhia ahu, ndi nākpọ kwa isi ala nye ihe-oyiyi-ya. 3 Mọ-ozi nke-abua we wusi ọkwa-ya nime oké osimiri; o we ghọ ọbara dika nke madu nwuru anwu; nkpuru-obi nile ọ bula nke di ndu we nwua, bú ihe di n'oké osimiri. 4 Mọ-ozi nke-atọ we wusi ọkwa-ya nime osimiri nile na isi-iyi nile nke miri nile; miri ahu we ghọ ọbara. 5 M'we nu mọ-ozi miri nile ka ọ nāsi, Onye ezi omume ka I bu, Gi Onye nādi adi, Onye di-kwa-ri, Onye di ọcha n'obi, n'ihi na I kpere ikpé ndia: 6 n'ihi na ha wusiri ọbara ndi nsọ na ndi-amuma, ọbara ka I nyewo-kwa-ra ha ka ha ṅua: ha bu ndi kwesiri ekwesi. 7 M'we nu ebe-ichu-àjà ahu ka ọ nāsi, E, Onye-nwe-ayi Chineke, Onye puru ime ihe nile, ikpé-Gi nile bu ezi-okwu na ikpé ziri ezi. 8 Mọ-ozi nke-anọ we wusi ọkwa-ya n'elu anyanwu; ewe nye ya ike iji ọku chab͕u madu. 9 Ewe were oké okpom-ọku chab͕ue madu: ha we kwulu aha Chineke ahu Onye nwere ike ichi ihe-otiti ndia isi; ha echègharighi kwa inye Ya otuto. 10 Mọ-ozi nke-ise we wusi ọkwa-ya n'elu oche-eze nke anu-ọhia ahu; ewe me ka ala-eze-ya b͕a ọchichiri; ha we tabìe ire-ha site n'aru-ufu, 11 ha we kwulu Chineke nke elu-igwe site n'aru-ufu nile ha na ọnyá nile ha; ha echègharighi kwa isi n'ọlu nile ha puta. 12 Mọ-ozi nke-isi we wusi ọkwa-ya n'elu osimiri uku ahu, bú Yufretis; miri-ya we tasia, ka ewe dozie uzọ ndi-eze ahu ndi si n'ọwūwa-anyanwu bia. 13 M'we hu ndi-mọ atọ nādighi ọcha, dika awọ̀, ka ha nēsi n'ọnu dragon ahu, si kwa n'ọnu anu-ọhia ahu, si kwa n'ọnu onye-amuma ugha ahu, puta: 14 n'ihi na ha bu mọ nke ndi-mọ ọjọ, nēme ihe-iriba-ama di iche iche; ndi nāpukuru ndi-eze nke elu-uwa dum madu bi, ime ka ha zukọ ibu agha nke oké ubọchi ahu nke Chineke, Onye puru ime ihe nile. 15 (Le, anamabia dika onye-ori. Ngọzi nādiri onye nēche nche, nēdebe kwa uwe-ya, ka ọ ghara ijeghari n'ọtọ, ha we hu ihere-ya. ) 16 Ha we me ka ha zukọ n'ebe ahu nke anākpọ n'asusu Hibru Amagedọn. 17 Mọ-ozi nke-asa we wusi ọkwa-ya n'elu mbara-elu-igwe; oké olu we si n'ulo nsọ ahu daputa, si n'ebe oche-eze ahu di, nāsi, Emewo ya: 18 àmùmà, na olu, na éb͕è-elu-igwe, we so; oké ala-ọma-jijiji so-kwa-ra, nke ala-ọma-jijiji di otú a adaghi mb͕e ọ bula site na mb͕e madu putara n'elu uwa, ala-ọma-jijiji di uku otú a, oké ala-ọma-jijiji di otú a. 19 Ewe kewa obodo uku ahu uzọ atọ, obodo nile nke mba nile we da: ewe cheta Babilon uku ahu n'iru Chineke, inye ya iko nke manya nke ọnuma nke iwe-Ya. 20 Agwe-etiti nile ọ bula we b͕alaga, ahughi kwa ugwu nile ọzọ. 21 Oké ákú-miri-ígwé, nke ra ka talent n'arọ́ n'otù, nēsi kwa n'elu-igwe ridata n'aru madu: madu we kwulu Chineke site n'ihe-otiti nke ákú-miri-ígwé ahu; n'ihi na ihe-otiti-ya di uku ri nne.

Nkpughe 17

1 Otù mọ-ozi n'etiti ndi-mọ-ozi asa ahu ndi nwere ọkwa asa ahu we bia, we kpayerem uka, si, Biari, m'gēgosi gi ikpé nke oké nwanyi ahu nākwa iko onye nānọkwasi n'ọtutu miri; 2 onye ya na ndi-eze uwa kwara iko, eme-kwa-ra ka manya ikwa-iko-ya bà ndi bi n'uwa n'anya. 3 O we bupum ba n'ọhia nime Mọ Nsọ: m'we hu nwanyi ka ọ nānọkwasi n'anu-ọhia nācha uhie uhie, nke nwere aha di iche iche juputara na nkwulu Chineke, nwe kwa isi asa na mpi iri. 4 Eb͕okwasiwo kwa nwanyi ahu ákwà ododo na ákwà uhie, ewerewo kwa ọla-edo na nkume di oké ọnu na pearl chọ ya nma, o nwe-kwa-ra ìko ọla-edo n'aka-ya nke juputara n'ihe-árú, bú ihe nile nādighi ọcha nke ikwa-iko-ya, 5 edekwasi-kwa-rari aha n'egedege-iru-ya, bú IHE-OMIMI, BABILON UKU AHU, NNE NKE NDI NÁKWA IKO NA NKE IHE-ÁRÚ NILE NKE UWA. 6 M'we hu nwanyi ahu ka ọbara ndi nsọ na ọbara ndi-àmà Jisus nābà ya n'anya dika manya. Mb͕e m'huru ya o we jum anya nke-uku. 7 Mọ-ozi ahu we sim, N'ìhi gini ka o juru gi anya? mu onwem gāgwa gi ihe-omimi nke nwanyi ahu, na nke anu-ọhia ahu nke nēburu ya, nke nwere isi asa ahu na mpi iri ahu. 8 Anu-ọhia ahu nke i huru diri, ọ dighi kwa ub͕u a; ọ gaje kwa isi n'abyss ahu rigoputa, na ila n'iyì. Ọ gēju kwa ndi bi n'elu uwa anya, bú ndi anēdeghi aha-ha n'akwukwọ nke ndu ahu site n'oge itọ ntọ-ala uwa, mb͕e ha nēle anu-ọhia ahu anya, na ọ diri, ọ dighi kwa ub͕u a, ọ gābia kwa. 9 N'ebe a ka uche nke nwere amam-ihe di. Isi asa ahu bu ugwu asa, nke nwanyi ahu nānọdu n'elu ha: 10 ndi-eze asa di kwa; ise nime ha adawo, otù nime ha nādi adi, onye fọduru akābiaghi; mb͕e ọ gābia ọ ghaghi kwa inọgide nwa oge. 11 Anu-ọhia ahu nke diri, nke nādighi kwa ub͕u a, ya onwe-ya bu kwa nke-asatọ, o si kwa n'asa ahu puta; ọ nāla kwa n'iyì. 12 Mpi iri ahu nke i hu-kwa-ra bu eze iri, madu ndi akānataghi ala-eze ọ bula; ma ha nānata ike dika ndi-eze, ha na anu-ọhia ahu, otù oge hour. 13 Ndia nwere otù ọlū, ha nēwere kwa ike-ha na ichi-isi-ha nye anu-ọhia ahu. 14 Ndia gēbu agha megide Nwa-aturu ahu, Nwa-aturu ahu gēmeri kwa ha, n'ihi na Ọ bu Onye-nwenu kachasi ndi-nwenu nile, na Eze kachasi ndi-eze nile; ndi soro Ya gēmeri kwa, bú ndi akpọworo, ndi arọputawo-kwa-ra, ndi kwesi-kwa-ra ntukwasi-obi. 15 O we sim, Miri nile i huru, ebe nwanyi ahu onye nākwa iko nānọdu, bu ndi di iche iche, na ìgwè madu, na mba di iche iche, na asusu di iche iche. 16 Mpi iri ahu i huru, ha na anu-ọhia ahu, ndia gākpọ nwanyi ahu nākwa iko asì, ha gēme kwa ya ka ọ buru onye tọb͕ọrọ n'efu buru kwa onye b͕a ọtọ, ha gēri kwa anu-aru-ya, rechapu kwa ya n'ọku. 17 N'ihi na Chineke tiyere n'obi-ha ime ìzù-Ya, na ib͕ata otù ìzù, na iwere ala-eze-ha nye anu-ọhia ahu, rue mb͕e agēmezu okwu nile nke Chineke. 18 Ma nwanyi ahu i huru bu obodo uku ahu, nke nwere ala-eze nāchi ndi-eze uwa.

Nkpughe 18

1 Mb͕e ihe ndia gasiri m'we hu mọ-ozi ọzọ ka o nēsi nelu-igwe ridata, nēnwe ike uku; ewe site n'ebube-ya nye uwa ìhè. 2 O we were olu ike tie nkpu, si, Ọ dawo, ọ dawo, bú Babilon uku ahu, ọ ghọwo kwa ebe-obibi nke ndi-mọ ọjọ, na ulo-nkpọrọ nke mọ nile ọ bula nādighi ọcha, na ulo-nkpọrọ nke nnunu nile ọ bula nke nādighi ọcha nke akpọwo-kwa-ra asì. 3 N'ihi na mba nile adawo site na manya nke ọnuma nke ikwa-iko-ya; ndi-eze uwa so-kwa-ra ya kwa iko, ndi-ahia nke uwa buru ọgaranya site n'ike nke inupu-isi-ya. 4 M'we nu olu ọzọ ka o nēsi n'elu-igwe dà, si, Ndi nkem, sinu nime ya puta, ka unu we ghara iso ya nwekọ nmehie-ya nile, ghara kwa inata ufọdu nime ihe-otiti-ya nile: 5 n'ihi na nmehie-ya nile rapakọrọ n'otù rue elu-igwe, Chineke cheta-kwa-ra ajọ omume-ya nile. 6 Nyeghachinu ya ọbuná dika ya onye-ya nyeghachiri madu, nye-kwa-nu ya okpukpu abua dika ọlu-ya nile di: nime iko ahu ọ kwara akwa, kwaranu ya okpukpu abua. 7 Ka ha ra, bú otuto o nyere onwe-ya, na inupu-isi ọ nupuru, nyenu ya nmekpa-aru na iru-újú ra otú ahu: n'ihi na ọ nāsi n'obi-ya, Anamanọdu dika eze-nwanyi, abughikwa m nwanyi di-ya nwuru, ọ dighi kwa iru-újú m'gāhu ma-ọli. 8 N'ihi nka ọ bu n'otù ubọchi ka ihe-otiti-ya nile gābia, bú ọnwu, na iru-újú, na unwu; agērechapu kwa ya n'ọku; n'ihi na Ọ di ike, bú Onye-nwe-ayi Chineke, Onye kpere ya ikpé. 9 Ndi-eze uwa, ndi soro ya kwa iko nupu kwa isi, ha gākwa-kwa-ra ya ákwá, ti-kwa-ra ya aka n'obi, mb͕e ha gēle anwuru-ọku nke orire-ọku-ya anya, 10 ka ha nēguzo n'ebe di anya n'ihi egwu nke nmekpa-aru-ya, nāsi, Ahuhu, ahuhu, obodo uku ahu, Babilon, bú obodo ahu di ike! n'ihi na n'otù oge hour ka ikpé-gi biara. 11 Ndi-ahia nke uwa nākwa-kwa-ra ya ákwá, nēru-kwa-ra ya újú, n'ihi na ọ dighi onye ọ bula nāzu ihe-ahia-ha ọzọ, bú nke ha nēweta n'ub͕ọ-ha; 12 ihe-ahia ọla-edo, na ọla-ọcha, na nkume di oké ọnu-ahia, na pearl, na ezi ákwà ọcha, na ákwà ododo, na nkisi, na ákwà uhie; na osisi nile ọ bula nēsì ísì utọ, na ihe nile ọ bula eji ọdu me, na ihe nile ọ bula eji osisi dikarisiri oké ọnu-ahia, ma-ọbu ọla, ma-ọbu ígwè, ma-ọbu marble, me; 13 na cinnamon, na amomum, na ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na manu-otite, na frankincense, na manya-vine, na manu, na utu ọkà, na ọka, na anu-ulo, na aturu; na ihe-ahia nke bu inyinya na ub͕ọ-ala na aru madu; na nkpuru-obi madu. 14 Nkpuru-osisi nile nke nāgu nkpuru-obi-gi apuwo n'ebe i nọ, ihe nile nātọ utọ nke ma-kwa-ra nma apuwo kwa n'aka-gi la n'iyì, madu agaghi-ahu kwa ha ọzọ ma-ọli. 15 Ndi-ahia ndi nāzu ihe ndia, ndi gburugburu ọgaranya site na ya, ha gēguzo n'ebe di anya n'ihi egwu nke nmekpa-aru-ya, nākwa ákwá, nēru kwa újú; 16 nāsi, Ahuhu, ahuhu, obodo uku ahu, nke eb͕okwasiworo ya ezi ákwà ọcha na ákwà nācha ọbara-ọbara na ákwà uhie, nke ewerewo-kwa-ra ọla-edo na nkume di oké ọnu-ahia na pearl ke ya! 17 n'ihi na n'otù oge hour emere ka oké àkù di otú a tọb͕ọ n'efu. Ndi-isi-ub͕ọ nile n'otù n'otù, na onye ọ bula nke nēje n'ebe ọ bula n'ub͕ọ, na ndi-ub͕ọ, ka ha ra kwa, bú ndi nālu ọlu nime oké osimiri, ha guzo-kwa-ra n'ebe di anya, 18 ti kwa nkpu mb͕e ha nēle anwuru-ọku nke orire-ọku-ya anya, si Òbodo gini yiri obodo uku a? 19 Ha we kpokwasi ájá n'isi-ha, ti kwa nkpu, nākwa ákwá, nēru kwa újú, si, Ahuhu, ahuhu, obodo uku ahu, nke ndi nile ndi nwere ub͕ọ-ha n'oké osimiri buru ọgaranya nime ya site n'ibi-obi-ya di oké ọnu-ahia! n'ihi na n'otù oge hour ka emere ka ọ tọb͕ọ n'efu. 20 Ka obi nātọ gi utọ n'isi ya, gi elu-igwe, na unu ndi nsọ, na unu ndi-ozi, na unu ndi-amuma; n'ihi na Chineke kpere ikpé-unu n'aru ya. 21 Otù mọ-ozi nke di ike we būru nkume, dika oké nkume-igwe-nri, we tubà ya nime oké osimiri, si, Otú a ka agātuda Babilon, bú obodo uku ahu, n'oké ọdida, agaghi-ahu kwa ya ọzọ ma-ọli. 22 Agaghi-anu kwa olu ndi nākpọ ubọ-akwara na ndi nākpọ ubọ ọzọ na ndi nēb͕u ọ̀jà na ndi nāfù opì nime gi ọzọ ma-ọli; agaghi-ahu kwa onye-ọ̀kà ọ bula, nke nēme ǹkà ọ bula, nime gi ọzọ ma-ọli; agaghi-anu kwa olu nke nkume-igwe-nri nime gi ọzọ ma-ọli; 23 ìhè nke oriọna agaghi-enwu kwa nime gi ọzọ ma-ọli; agaghi-anu kwa olu nke onye nālu nwunye ọhu na nke nwanyi anālu ọhu nime gi ọzọ ma-ọli: n'ihi na ndi-ahia-gi buri ndi-amadi nke uwa; n'ihi na ewere igwọ-nsi-gi duhie mba nile. 24 Ọ bu kwa nime ya ka ahuru ọbara nke ndi-amuma na nke ndi nsọ, na nke ndi nile eb͕uworo n'elu uwa.

Nkpughe 19

1 Mb͕e ihe ndia gasiri m'we nu ihe dika oké olu nke oké ìgwè ndi nọ n'elu-igwe, nāsi, Haleluya; Nzọputa nile na otuto nile na ike nile nādiri Chineke-ayi: 2 n'ihi na ikpé-Ya nile bu ezi-okwu buru kwa ikpé ziri ezi; n'ihi na O kpere oké nwanyi ahu nākwa iko ikpé, bú nwanyi nke were ikwa-iko-ya mebie uwa, Ọ bọ̀-kwa-ra ọ́bọ̀ ọbara ndi-orù-Ya n'isi-ya. 3 Nke mere ya abua ha we si, Haleluya. Anwuru-ọku-ya nārigo elu rue mb͕e nile ebighi-ebi. 4 Orú ndi-okenye na anọ ahu na ihe anọ ahu nke di ndu we da n'ala, kpọ isi ala nye Chineke, bú Onye nānọkwasi n'oche-eze ahu, si, Amen; Haleluya. 5 Otù olu we site n'oche-eze ahu da, si, Nētonu Chineke-ayi, unu ndi-orù-Ya nile, ndi nātu egwu Ya, ndi ntà na ndi uku. 6 M'we nu ihe dika olu nke oké ìgwè ndi, di kwa ka olu ọtutu miri, di kwa ka olu éb͕è-elu-igwe di ike, nāsi, Haleluya: n'ihi na Onye-nwe-ayi Chineke-ayi, Onye puru ime ihe nile, nābu eze. 7 Ka ayi ṅuria ọṅu, ka obi nātọ kwa ayi utọ nke-uku, ka ayi were kwa otuto nile nye Ya: n'ihi na ọlulu-nwunye nke Nwa-aturu ahu abiawo, nwunye-Ya edoziwo kwa onwe-ya. 8 Ewe kweyere ya ka o b͕okwasi onwe-ya ezi ákwà ọcha nēnwu enwu, nke di kwa ọcha: n'ihi na ezi ákwà ọcha ahu bu ezi omume nile nke ndi nsọ. 9 O we sim, De akwukwọ, Ngọzi nādiri ndi akpọworo ibia na nri-anyasi ọlulu-nwunye nke Nwa-aturu ahu. O we sim, Ndia bu okwu nke Chineke kwuru n'ezie. 10 M'we da n'ala n'iru ukwu-ya ikpọ isi ala nye ya. O we sim, Lezi anya ka i ghara ime ya: abum orù-ibe-gi, buru kwa orù-ibe nke umu-nna-gi nke nwere àmà nke Jisus: kpọ isi ala nye Chineke: n'ihi na àmà nke Jisus bu mọ nke amuma. 11 M'we hu elu-igwe ka o gheworo oghe; ma le, inyinya ọcha di, na Onye nānọkwasi ya, bú Onye anākpọ Onye kwesiri ntukwasi-obi na Onye-ezi-okwu; ọ bu kwa n'ezi omume ka Ọ nēkpe ikpé, nēbu kwa agha. 12 Anya-Ya abua buru kwa ire ọku, Ọ nēkpu kwa ọtutu okpu-eze n'isi-Ya; O nwe-kwa-ra aha edeworo, nke ọ nādighi onye ọ bula matara, ma-ọbughi Ya onwe-ya. 13 Eb͕okwasiwo kwa Ya uwe nke efesaworo ọbara: akpọwo kwa aha-Ya Okwu Chineke. 14 Usu nile nke ndi-agha ndi di n'elu-igwe we so Ya n'elu inyinya ọcha, nēyi ezi ákwà ọcha, nke di ọcha nēnwu kwa enwu. 15 Mma-agha di nkọ nēsi kwa n'ọnu-Ya puta, ka O we were ya tib͕ue mba nile: Ya onwe-ya gēwere kwa nkpa-n'aka nke ígwè zùa ha dika aturu: Ya onwe-ya nāzọ kwa ebe-nzọcha-nkpuru-vine nke manya nke ọnuma nke iwe Chineke Onye puru ime ihe nile. 16 O nwe-kwa-ra aha edekwasiworo n'elu uwe-Ya na n'elu apata-ukwu-Ya, EZE kachasi NDI-EZE nile, NA ONYE-NWENU kachasi NDI-NWENU nile. 17 M'we hu otù mọ-ozi ka ọ nēguzo nime anyanwu; o we were oké olu tie nkpu, nāsi nnunu nile nke nēfe n'etiti elu-igwe, Bianu, zukọ iri oké nri-anyasi nke Chineke; 18 ka unu we rie anu-aru ndi-eze, na anu-aru ndi-ọchi-agha, na anu-aru ndi di ike, na anu-aru inyinya na nke ndi nānọkwasi ha, na anu-aru madu nile, ma ndi nwere onwe-ha ma ndi-orù, ma ndi ntà ma ndi uku. 19 M'we hu anu-ọhia ahu, na ndi-eze uwa, na usu nile nke ndi-agha-ha, ka ha zukọrọri ibu agha megide Onye ahu Nke nānọkwasi inyinya ahu, megide kwa usu-ndi-agha-Ya. 20 Ewe jide anu-ọhia ahu, ya na onye-amuma ugha ahu nke nēme ihe-iriba-ama ahu n'iru ya, bú nke o ji duhie ndi natarari akàrà nke anu-ọhia ahu, na ndi nākpọ isi ala nye ihe-oyiyi-ya: ewe tubà ha abua na ndu nime ọdọ ọku ahu nke ji brimstone nēre: 21 ewe were mma-agha nke Onye ahu nānọkwasi n'inyinya ahu, bú mma-agha ahu nke si n'ọnu-Ya puta, b͕ue ndi fọduru: nnunu nile we rijuru afọ site n'anu-aru-ha.

Nkpughe 20

1 M'we hu mọ-ozi ka o nēsi n'elu-igwe ridata, nēji nkpisi-ugodi nke abyss ahu n'aka-ya, ya na oké nkpọrọ. 2 O we jide dragon ahu, bú agwọ ochie ahu, onye bu Ekwensu na Setan, o we ke ya ab͕u nnù arọ abua na ọgu iri, 3 we tubà ya nime abyss ahu, mechie ya, kà kwa ya akàrà n'elu ya, ka o we ghara iduhie mba nile ọzọ, rue mb͕e nnù arọ abua na ọgu iri ahu gāgwusi: mb͕e arọ ndia gasiri aghaghi itọpu ya nwa oge. 4 M'we hu oche-eze, ha we nọkwasi ha, we nye ha ikpé: m'we hu nkpuru-obi nke ndi ebipururi isi n'ihi àmà Jisus, na n'ihi okwu Chineke, ndi ahu nọ kwa, bú ndi nākpọghi isi ala nye anu-ọhia ahu, ma-ọbu ihe-oyiyi-ya, ndi nānataghi kwa akàrà-ya n'egedege-iru-ha na n'aka-ha; ha we di ndu, so kwa Kraist buru eze nnù arọ abua na ọgu iri. 5 Ndi fọduru n'etiti ndi nwuru anwu adighi ndu rue mb͕e nnù arọ abua na ọgu iri ahu gāgwusi. Nka bu nbilite-n'ọnwu mbu. 6 Ngọzi nādiri ya, ọ di kwa nsọ, bú onye nwere òkè nime nbilite-n'ọnwu mbu ahu: ọnwu nke-abua ahu enweghi ike n'ebe ndia nọ; kama ha gābu ndi-nchu-àjà nke Chineke na nke Kraist, ha gēso kwa Ya buru eze nnù arọ abua na ọgu iri ahu. 7 Ma mb͕e nnù arọ abua na ọgu iri ahu gāgwusi, agātọpu Setan n'ulo-nkpọrọ-ya, 8 ọ gāputa kwa iduhie mba nile ndi di na nkuku anọ nke uwa, bú Gog na Megog, ime ka ha zukọ ibu agha ahu: ndi ọnu-ọgugu-ha ra ka ájá nke oké osimiri. 9 Ha we rigo n'obodobo uwa, nọgide ọmuma-ulo-ikwū ndi nsọ gburugburu, ya na obodo ahu nke ahuworo n'anya: ọku we si n'elu-igwe ridata, ripia ha. 10 Ekwensu ahu nke nēduhie ha, atubàra ya nime ọdọ ọku na brimstone, ebe anu-ọhia ahu na onye-amuma ugha ahu nọ kwa; agēmekpa kwa ha aru ehihie na abali rue mb͕e nile ebighi-ebi. 11 M'we hu oké oche-eze di ọcha, na Onye nānọkwasi ya, Onye uwa na elu-igwe b͕apuru n'iru Ya; ahughi kwa ebe ọ bula nye ha. 12 M'we hu ndi nwuru anwu nile, ndi uku na ndi ntà, ka ha nēguzo n'iru oche-eze ahu; ewe saghe akwukwọ di iche iche: asaghe-kwa-ra akwukwọ ọzọ, nke bu akwukwọ nke ndu: ewe kpe ndi nwuru anwu ikpé site n'ihe nile edereri n'akwukwọ ahu di iche iche, dika ọlu nile ha si di. 13 Oké osimiri we nyeghachi ndi nwuru anwu di nime ya; ọnwu na Hedis nyeghachi-kwa-ra ndi nwuru anwu di nime ha: ewe kpe ha ikpé n'otù n'otù dika ọlu nile ha si di. 14 Ewe tubà ọnwu na Hedis nime ọdọ ọku ahu. Nka bu ọnwu nke-abua ahu, bú ọdọ ọku ahu. 15 Ọ buru kwa na ahughi onye ọ bula ka edereri aha-ya n'akwukwọ nke ndu ahu, ewe tubà ya n'ọdọ ọku ahu.

Nkpughe 21

1 M'we hu elu-igwe ọhu na uwa ọhu: n'ihi na elu-igwe mbu ahu na uwa mbu ahu gabigarari; oké osimiri adighi kwa ọzọ. 2 M'we hu obodo nsọ ahu, bú Jesusalem ọhu, ka ọ nēsi n'elu-igwe ridata, site n'ebe Chineke nọ, edoziwo ya dika nwanyi anālu ọhu nke achọworo ya nma nye di-ya. 3 M'we nu oké olu ka ọ nēsi n'oche-eze ahu dà, si, Le, ūlọ-ikwū nke Chineke diyere madu, Ọ gēbiye-kwa-ra ha, ha onwe-ha gābu kwa ndi nke Ya, Chineke Onwe-ya gānọye-kwa-ra ha, buru kwa Chineke-ha: 4 Ọ gēhichapu kwa anya-miri nile ọ bula n'anya-ha; ọnwu agaghi-adi kwa ọzọ; iru-újú ma-ọbu ikwa-ákwá ma-ọbu aru-ufu agaghi-adi kwa ọzọ: ihe ngbu nile agabigawo. 5 Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu we si, Le, anameme ihe nile ka ha di ọhu. O we si, De akwukwọ: n'ihi na okwu ndia kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa ezi-okwu. 6 O we sim, Emewo ha. Mu onwem bu Alfa ahu na Omega ahu, nmalite na ọgwugwu. Mu onwem gēnye onye akpiri nākpọ nku miri site n'isi-iyi miri nke ndu ahu n'efu. 7 Onye nēmeri gēketa ihe ndia; M'gābu-kwa-ra ya Chineke, ya onwe-ya gābu-kwa-ram nwa. 8 Ma ndi nātu ujọ, na ndi nēkweghi ekwe, na ndi-árú, na ndi-ob͕u-madu, na ndi nākwa iko, na ndi nāgwọ ńsí, na ndi nēkpere arusi, na ndi-ugha nile, òkè-ha gābu nime ọdọ ahu nke ji ọku na brimstone nēre; nke bu ọnwu nke-abua ahu. 9 Otù nime ndi-mọ-ozi asa ahu ndi nwere ọkwa asa ahu, ndi eboro ibu ihe-otiti asa ikpe-azu, we bia; o we kpayerem uka, si, Biari, M'gēgosi gi nwanyi ahu anālu ọhu, bú nwunye Nwa-aturu ahu. 10 O we bupum nime Mọ Nsọ ga rue oké ugwu di elu, we gosim obodo nsọ ahu, bú Jerusalem, ka ọ nēsi n'elu-igwe ridata, site n'ebe Chineke nọ, 11 nēnwe ebube Chineke: ìhè ọ nēnye yiri nkume dikarisiri oké ọnu-ahia, dika nkume jasper, dika crystal: 12 o nwe-kwa-ra oké mb͕idi di elu; nwe kwa ọnu-uzọ-ama iri na abua, nwe kwa ndi-mọ-ozi iri na abua n'ọnu-uzọ-ama ahu; nwe kwa aha edekwasiworo ha, nke bu aha nke ebo iri na abua nke umu Israel: 13 n'akuku Ọwuwa-anyanwu ọnu-uzọ-ama atọ di; n'akuku Ugwu ọnu-uzọ-ama atọ di kwa; n'akuku Ndida ọnu-uzọ-ama atọ di kwa; n'akuku Ọdida-anyanwu ọnu-uzọ-ama atọ di kwa. 14 Mb͕idi obodo ahu nwe-kwa-ra ntọ-ala iri na ab͕ua, n'elu ha ka edereri aha iri na abua nke ndi-ozi iri na abua ahu nke Nwa-aturu ahu. 15 Onye ahu nke nākpayerem uka nwe-kwa-ra ihe-ọtùtù, bú amì nke ọla-edo, ka o we tùa obodo ahu, na ọnu-uzọ-ama-ya nile, na mb͕idi-ya. 16 Obodo ahu nwe-kwa-ra nkuku anọ ra nrata, ogologo-ya ra kwa ka obodobo-ya: o we were amì ahu tùa obodo ahu, orú nnù furlong na nnù iri: ogologo-ya na obodobo-ya na elu-ya ra. 17 O we tù mb͕idi-ya, ọgu cubit asa na anọ, dika ọtùtù madu si di, ya bu, nke mọ-ozi. 18 Ihe eji lu mb͕idi ahu bu jasper: obodo ahu bu kwa ọla-edo anuchara anucha, dika enyo nēnwu enwu. 19 Ewerewo nkume nile ọ bula di oké ọnu-ahia chọ ntọ-ala nke mb͕idi obodo ahu nma. Ntọ-ala mbu bu jasper; nke-abua bu sapphire; nke-atọ bu chalcedony; nke-anọ bu emerald; 20 nke-ise bu sardonyx; nke-isi bu sardius; nke-asa bu chrysolite; nke-asatọ bu beryl; nke-iteghete bu topaz; nke-iri bu chrysoprase; nke-iri-na-otù bu jacinth; nke-iri-na-abua bu amethyst. 21 Ọnu-uzọ-ama iri na abua ahu bu pearl iri na abua; eji otù pearl me ọnu-uzọ-ama ọ bula nime ọnu-uzọ-ama ahu nile: amá obodo ahu bu ọla-edo anuchara anucha, dika enyo nāhu uzọ. 22 Ọ dighi kwa ulo nsọ ọ bula m'huru nime ya: n'ihi na Onye-nwe-ayi Chineke, Onye puru ime ihe nile, Ya na Nwa-aturu ahu, bu ulo nsọ ya. 23 Anyanwu ma-ọbu ọnwa adighi kwa obodo ahu nkpà, ka ha mukwasi ya: n'ihi na ebube Chineke nyere ya ìhè, oriọna-ya bu kwa Nwa-aturu ahu. 24 Mba nile gēwere kwa ìhè-ya jegharia: ndi-eze nke uwa nēwebata kwa ebube-ha nime ya. 25 Agaghi-emechi kwa ọnu-uzọ-ama-ya n'ehihie ma-ọli (n'ihi na abali agaghi-adi n'ebe ahu): 26 ha gēwebata kwa ebube na nsọpuru nke mba nile nime ya: 27 ọ dighi kwa ihe ọ bula emeruru emeru, ma-ọbu onye nēme ihe-árú na ugha, gābà nime ya ma-ọli: kama ọ bu nání ndi edeworo aha-ha n'akwukwọ nke ndu Nwa-aturu ahu.

Nkpughe 22

1 O we gosim osimiri nke miri nke ndu, nēnwu dika crystal, ka ọ nēsi n'oche-eze Chineke na nke Nwa-aturu ahu puta, 2 n'etiti amá-ya. N'akuku a na n'akuku nke-ọzọ nke osimiri ahu ka osisi nke ndu di kwa, nāmi uzọ nkpuru iri na abua, nēnye nkpuru-ya n'ọnwa n'ọnwa: akwukwọ osisi ahu bu ihe ime ka aru di mba nile ike. 3 Ọbubu-ọnu ọ bula agaghi-adi ọzọ: oche-eze Chineke na nke Nwa-aturu ahu gādi kwa nime ya: ndi-orù-Ya gēfè kwa Ya òfùfè: 4 ha gāhu kwa iru-Ya; aha-Ya gādi kwa n'egedege-iru-ha. 5 Abali agaghi-adi kwa ọzọ; ìhè oriọna na ìhè anyanwu adighi kwa ha nkpà; n'ihi na Onye-nwe-ayi Chineke gēnye ha ìhè: ha ganābu kwa eze rue mb͕e nile ebighi-ebi. 6 O we sim, Okwu ndia kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa ezi-okwu: Onye-nwe-ayi, bú Chineke nke ndi-mọ nke ndi-amuma, zite-kwa-ra mọ-ozi-Ya igosi ndi-orù-Ya ihe nile nāghaghi iputa na mb͕e ntà. 7 Le kwa, anamabia ọsọsọ. Ngọzi nādiri onye nēdebe okwu nile nke amuma nke akwukwọ a. 8 Mu onwem Jọn bu kwa onye nānu nāhu kwa ihe ndia. Mb͕e m'nuru, hu kwa, m'we da n'ala ikpọ isi ala n'iru ukwu mọ-ozi ahu onye nēgosim ihe ndia. 9 O we sim, Lezi anya ka i ghara ime ya: abum orù-ibe-gi, buru kwa orù-ibe nke umu-nna-gi, bú ndi-amuma, ha na ndi nēdebe okwu nile nke akwukwọ a: kpọ isi ala nye Chineke. 10 O we sim, Akala okwu nile nke amuma nke akwukwọ a akàrà; n'ihi na oge ahu di nso. 11 Onye nēme ajọ omume, ya me ajọ omume ga n'iru: onye ru-kwa-ra inyi, ka eme ka o ru inyi ga n'iru: onye ezi omume, ya me ezi omume ga n'iru: onye di kwa nsọ, ka edo ya nsọ ga n'iru. 12 Le, anamabia ọsọsọ; ugwọ-ọlum di kwa n'akam, inyeghachi onye ọ bula dika ọlu-ya si di. 13 Mu onwem bu Alfa ahu na Omega ahu, onye mbu na onye ikpe-azu, nmalite na ọgwugwu. 14 Ngọzi nādiri ndi nāsa uwe-nwuda-ha, ka ha we nwe ike n'ebe osisi nke ndu ahu di, si kwa n'ọnu-uzọ-ama ahu ba nime obodo ahu. 15 N'azu obodo ka ha di, bú nkita nile, na ndi nile nāgwọ nsi, na ndi nile nākwa iko, na ndi-ob͕u-madu nile, na ndi nēkpere arusi, na onye ọ bula nke nāhu ugha n'anya nēme kwa ya. 16 Mu onwem, bú Jisus, zitere mọ-ozim iwere ihe ndia b͕ara unu àmà nye nzukọm nile. Mu onwem bu nkpọrọgwu Devid, buru kwa nwa ọ muru, kpakpando nēnwu enwu, nke bu kwa kpakpando ututu ahu. 17 Mọ Nsọ na nwanyi ahu anālu ọhu nāsi kwa, Bia. Onye nānu, ya si kwa, Bia. Onye akpiri nākpọ kwa nku, ya bia: onye nāchọ, ya nara miri nke ndu ahu n'efù. 18 Mu onwem nāb͕ara onye ọ bula àmà, bú onye nānu okwu nile nke amuma nke akwukwọ a, si, Ọ buru na onye ọ bula gātukwasiri ha okwu, Chineke gātukwasiri ya ihe-otiti nile nke edeworo n'akwukwọ a: 19 ọ buru kwa na onye ọ bula gēwepu okwu nime okwu nile nke akwukwọ nke amuma nka, Chineke gēwepu òkè-ya n'osisi nke ndu ahu, wepu kwa òkè-ya n'obodo nsọ ahu, bú ihe edeworo n'akwukwọ a. 20 Onye ahu Nke nāb͕a àmà ndia nāsi, E: anamabia ọsọsọ. Amen: bia, Onye-nwe-ayi Jisus. 21 Ka amara Onye-nwe-ayi Jisus diyere ndi nsọ nile. Amen.